GEN 1:1 Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa.
GEN 1:2 Ụwa bụ ihe na-enweghị ụdịdị ọbụla, bụrụkwa ihe tọgbọrọ nʼefu. Ọchịchịrị gbara nʼelu ogbu mmiri dị omimi. Mmụọ nke Chineke na-erugharị nʼelu ogbu mmiri ahụ.
GEN 1:3 Mgbe ahụ Chineke kwuru sị, “Ka ìhè dị,” ìhè dịkwara.
GEN 1:4 Chineke hụrụ na ìhè ahụ mara mma. Ọ kpara oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.
GEN 1:5 Chineke kpọrọ ìhè ahụ Ehihie, kpọọ ọchịchịrị ahụ Abalị. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke mbụ.
GEN 1:6 Chineke kwukwara sị, “Ka mbara pụta nke ga-ekewapụ mmiri dị nʼelu mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼokpuru mbara ahụ”
GEN 1:7 Ya mere, Chineke mere mbara, kewapụ mmiri dị nʼokpuru mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼelu mbara ahụ. O sikwa otu a dịrị.
GEN 1:8 Mbara ahụ ka Chineke kpọrọ mbara eluigwe. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke abụọ.
GEN 1:9 Chineke kwuru sị, “Ka mmiri dị nʼokpuru mbara eluigwe chịkọta onwe ha ọnụ nʼotu ebe, ka ala akọrọ pụta.” O sikwa otu a dịrị.
GEN 1:10 Chineke kpọrọ ala akọrọ ahụ “ala,” kpọọ mmiri ahụ chịkọtara onwe ha ọnụ “osimiri.” Chineke lere anya hụ na ha dị mma.
GEN 1:11 Chineke kwuru sị, “Ka ala pupụta ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ, na osisi dị nʼelu ala nke na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha dị iche iche si dị.” O sikwa otu a dịrị.
GEN 1:12 Ala puputara ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ dịka ụdịdị ha si dị, na osisi na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma.
GEN 1:13 Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke atọ.
GEN 1:14 Chineke kwuru sị, “Ka ìhè nke na-enye ìhè dịrị na mbara eluigwe, ikewapụ ehihie site nʼabalị. Ka ha bụrụ ihe ama igosi oge dị iche iche, ụbọchị dị iche iche, na afọ dị iche iche.
GEN 1:15 Ka ha bụrụ ìhè na mbara eluigwe inye ìhè nʼelu ụwa.” O si otu a dịrị.
GEN 1:16 Chineke mere ìhè ukwu abụọ, nke kacha ịdị ukwu ka ọ bụrụ nke ga-achị ehihie, ma nke dị nta ka ọ bụrụ nke ga-achị abalị. O mekwara kpakpando dị iche iche.
GEN 1:17 Chineke debere ha na mbara eluigwe inye ìhè nʼụwa,
GEN 1:18 ịchị ehihie na abalị na ịkpa oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma.
GEN 1:19 Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke anọ.
GEN 1:20 Chineke kwuru sị, “Ka mmiri jupụta nʼihe ndị na-eku ume, ka ụmụ anụ ufe fegharịkwa nʼelu ụwa, ma nʼelu mbara igwe.”
GEN 1:21 Ya mere Chineke kere anụ ukwu niile bi na mmiri, na anụ niile nwere ndụ bi na mmiri, na ụdị ihe ọbụla nwere ndụ na-akpụgharị akpụgharị ndị jupụtara na mmiri, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ ufe niile dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma.
GEN 1:22 Chineke gọziri ha, sị ha, “Mụbaanụ, dịkwanụ ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụtanụ osimiri niile. Ka anụ ufe dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ nʼelu ụwa.”
GEN 1:23 Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke ise.
GEN 1:24 Chineke kwuru sị, “Ka ala wepụta ụmụ anụ dị iche iche nwere ndụ dịka ụdịdị ha si dị: anụ ụlọ, anụ na-akpụgharị nʼala, na anụ ọhịa, nke ọbụla dịka ụdịdị ya si dị.” O si otu a dịrị.
GEN 1:25 Chineke mere ụmụ anụ ọhịa, dịka ụdịdị ha si dị, mee anụ ụlọ, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ niile nwere ndụ nke na-akpụgharị nʼala dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma.
GEN 1:26 Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, “Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala.”
GEN 1:27 Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha.
GEN 1:28 Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.”
GEN 1:29 Mgbe ahụ, Chineke sịrị “Enyela m unu ahịhịa ubi niile na-amị mkpụrụ dị nʼelu ụwa, na osisi ọbụla mịrị mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ha, ka ha bụrụ ihe oriri gị.
GEN 1:30 Ma ụmụ anụmanụ niile na anụ ufe niile, na anụ niile e kere eke na-akpụgharị akpụgharị nʼala, anụ ọbụla nwere ndụ nʼime ha ka m na-enye ahịhịa ndụ niile ka ọ bụrụ ihe oriri ha.”
GEN 1:31 Chineke legharịrị anya nʼihe o kere, hụ na ọ dị ezi mma. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke isii.
GEN 2:1 Otu a ka e si rụzuo ọrụ ike eluigwe na ụwa na ihe niile dị nʼime ha.
GEN 2:2 Nʼụbọchị nke asaa, Chineke kwụsịrị ọrụ ya nke ọ na-arụ, o zukwara ike site nʼọrụ ya niile.
GEN 2:3 Chineke gọziri ụbọchị nke asaa ahụ mee ya ka ọ bụrụ ụbọchị dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nʼụbọchị ahụ ka ọ zuru ike site nʼọrụ nke ike ihe niile.
GEN 2:4 Nke a bụ akụkọ banyere usoro okike eluigwe na ụwa mgbe e kere ha, nʼụbọchị ahụ mgbe Onyenwe anyị Chineke kere eluigwe na ụwa.
GEN 2:5 Ahịhịa ọbụla epupụtabeghị nʼọhịa, o nwekwaghị ihe ubi ọbụla sitere nʼala pupụta, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ezitebeghị mmiri ozuzo nʼelu ụwa, o nwekwaghị mmadụ ọbụla nọ na-arụ ọrụ ubi,
GEN 2:6 ma mmiri si nʼala na-asọpụta na-asọ nʼelu ala niile.
GEN 2:7 Onyenwe anyị Chineke kpụrụ mmadụ site nʼaja nke ala, kunye ya ume ndụ nʼimi ya, nke mere ka mmadụ ghọọ ihe dị ndụ.
GEN 2:8 Onyenwe anyị Chineke kụrụ ubi a gbara ogige nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼIden. O tinyere mmadụ ahụ ọ kpụrụ nʼime ubi a.
GEN 2:9 Onyenwe anyị Chineke mere ka osisi dị iche iche si nʼala pupụta, osisi ndị dị mma ile anya na nke dịkwa mma iri eri. Nʼetiti ogige a, e nwere osisi na-enye ndụ, na osisi nke ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ.
GEN 2:10 E nwere iyi si nʼIden na-asọpụta na-asọbanye nʼime ogige ahụ ime ka ala ahụ nwee mmiri. Site nʼebe ahụ, iyi a kewara nwee ngalaba anọ.
GEN 2:11 Aha ngalaba nke mbụ bụ Paịshọn. Ọ sọọrọ ogologo gafee ala niile nke Havila, ebe a na-enweta ọlaedo.
GEN 2:12 (Ọlaedo dị nʼala ahụ mara mma. Eso osisi na-esi isi ụtọ na nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ ọniks dịkwa nʼebe ahụ.)
GEN 2:13 Aha ngalaba nke abụọ bụ Gaihọn. O sitere nʼala Kush gafee.
GEN 2:14 Aha osimiri nke atọ bụ Taịgris. Ọ na-asọla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ala Ashọ. Aha osimiri nke anọ bụ Yufretis.
GEN 2:15 Onyenwe anyị Chineke weere mmadụ ahụ tinye ya nʼogige Iden, ka ọ na-akọ ya ma bụrụkwa onye na-elekọta ya.
GEN 2:16 Onyenwe anyị Chineke nyere mmadụ ahụ iwu sị ya “I nwere ike iri mkpụrụ osisi niile dị nʼubi a,
GEN 2:17 ma ị gaghị eri mkpụrụ si nʼosisi ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Nʼihi na ụbọchị i riri ya ị ga-anwụrịrị.”
GEN 2:18 Onyenwe anyị Chineke kwuru sị, “Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya.”
GEN 2:19 Onyenwe anyị Chineke sitere nʼala kpụọ ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe. O dutere ha ka ọ mara ihe mmadụ ahụ ga-akpọ ha. Ihe ọbụla mmadụ ahụ kpọrọ ihe ọbụla ndị a nwere ndụ, nke ahụ bụkwa aha ya.
GEN 2:20 Ya mere, mmadụ ahụ nyere anụ ụlọ niile na anụ ufe niile na anụ ọhịa niile aha. Ma nʼebe Adam nọ, o nweghị onye inyeaka kwesiri ya.
GEN 2:21 Ya mere, Onyenwe anyị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya.
GEN 2:22 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ.
GEN 2:23 Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.”
GEN 2:24 Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.
GEN 2:25 Nwoke ahụ na nwunye ya gba ọtọ, ma ihere emeghị ha.
GEN 3:1 Agwọ dị aghụghọ karịa ụmụ anụ ọhịa niile Onyenwe anyị Chineke kere. Ọ bịakwutere nwanyị ahụ sị ya, “Ọ bụ ezie na Chineke sị unu erila mkpụrụ si nʼosisi niile dị nʼogige a?”
GEN 3:2 Nwanyị ahụ zara sị ya, “Anyị nwere ike rie mkpụrụ si nʼosisi niile dị nʼogige a
GEN 3:3 ma Chineke kwuru sị, ‘Unu erila mkpụrụ si nʼosisi dị nʼetiti ogige a, unu emetụkwala ya aka, ka unu ghara ịnwụ.’ ”
GEN 3:4 Agwọ gwara nwanyị ahụ sị, “Unu agaghị anwụ.
GEN 3:5 Nʼihi na Chineke maara na ọ bụrụ na unu erie ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-amata ezi ihe na ajọ ihe.”
GEN 3:6 Nwanyị ahụ hụrụ na mkpụrụ si nʼosisi ahụ dị mma iri eri, na ọ dị mma nʼanya, na ọ bụ osisi mara mma e si enweta amamihe. Ọ ghọọrọ mkpụrụ ahụ rie, nyekwa di ya, onye nke na ya nọ, o rie.
GEN 3:7 Mgbe ahụ, anya ha abụọ meghere, ha chọpụtara na ha gba ọtọ. Ya mere, ha dụkọtara ahịhịa fiig, jiri ya mere onwe ha akwa.
GEN 3:8 Mgbe nwoke ahụ na nwunye ya nụrụ ụda njegharị Onyenwe anyị Chineke nʼogige ahụ nʼoge uhuruchi, ha zoro onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị Chineke nọ nʼetiti osisi ndị dị nʼogige ahụ.
GEN 3:9 Ma Onyenwe anyị Chineke kpọrọ nwoke ahụ oku sị ya, “Ebee ka ị nọ?”
GEN 3:10 Ọ zara si, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m.”
GEN 3:11 Onyenwe anyị Chineke jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? I riela mkpụrụ si nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị gị erila?”
GEN 3:12 Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.”
GEN 3:13 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.”
GEN 3:14 Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere, “Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile na nʼetiti anụ ọhịa niile. Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije, aja ka ị ga na-eri ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
GEN 3:15 Aga m eme ka iro dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ, nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya, mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi, gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.”
GEN 3:16 Ọ gwara nwanyị ahụ sị ya, “Aga m eme ka ihe mgbu nke ịmụ nwa gị baa ụba nke ukwuu, ọ bụ site nʼihe mgbu ka ị ga-eji mụpụta ụmụ gị. Ọchịchọ nke obi gị ga-adị nʼaka di gị, ọ bụ ya ga-achịkwa gị.”
GEN 3:17 Ọ gwara Adam sị, “Nʼihi na ị ṅara nwunye gị ntị, rie mkpụrụ site nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị, ‘Gị erila mkpụrụ sitere na ya,’ “Ala bụ ihe a bụrụ ọnụ nʼihi gị, site nʼoke ndọgbu nʼọrụ ka ị ga-eri ihe si na ya pụta ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
GEN 3:18 Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke, ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi.
GEN 3:19 Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu ka ị ga-eri nri gị tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị nʼihi na aja ka ị bụ, nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.”
GEN 3:20 Adam gụrụ nwunye ya Iiv, nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ.
GEN 3:21 Emesịa, Onyenwe anyị Chineke weere akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe oyiyi.
GEN 3:22 Onyenwe anyị Chineke sịrị, “Lee, mmadụ adịla ka onye ọbụla nʼime anyị site nʼịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Ugbu a, ka ọ gharakwa ị setịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi ahụ na-enye ndụ rie, si otu a dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
GEN 3:23 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị Chineke chụpụrụ ya site nʼogige Iden ka ọ gaa na-arụ ọrụ nʼala e si wepụta ya.
GEN 3:24 Mgbe ọ chụpụrụ mmadụ, o dochiri nʼọwụwa anyanwụ nke ogige Iden ndị mmụọ ozi dị ike a na-akpọ Cherubim, na mma agha na-acha ọkụ, ka ha na-eche ọnụ ụzọ e si aba nʼebe osisi ahụ na-enye ndụ dị nche.
GEN 4:1 Emesịa, Adam na nwunye ya Iiv dinakọrọ dịka di na nwunye. Iiv tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye ha gụrụ Ken. Iiv sịrị, “Site nʼinyeaka Onyenwe anyị, amụtala m nwa nwoke!”
GEN 4:2 Emesịa Iiv mụtara nwanne ya nwoke Ebel. Ebel ghọrọ onye na-azụ igwe atụrụ. Ma Ken ghọrọ onye ọrụ ubi.
GEN 4:3 Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ken wetaara Onyenwe anyị ụfọdụ ihe ubi ya dịka onyinye.
GEN 4:4 Ma Ebel, ya onwe ya nyekwara onyinye site nʼigwe ewu na atụrụ ya e bụ ụzọ mụọ, nke mara abụba. Onyenwe anyị nabatara Ebel na onyinye ya,
GEN 4:5 ma ọ nabataghị Ken na onyinye ya. Nke a wutere Ken, mee ka o wee iwe dị ukwuu. Ihu ya agbarụọ.
GEN 4:6 Ma Onyenwe anyị jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji ewe iwe? Gịnị mere ihu gị ji gbarụọ?
GEN 4:7 Ọ bụrụ na i mee ihe ziri ezi, agaghị anabata gị? Ọ bụrụkwanụ na ị jụ ime ihe ziri ezi, mmehie nọ nʼọnụ ụzọ na-eche gị ịla gị nʼiyi. Lezie anya hụ na i meriri ya.”
GEN 4:8 Ken gwara nwanne ya Ebel sị, “Bịa soro m ka anyị banye ọhịa.” Mgbe ha nọ nʼebe ahụ, Ken jidere nwanne ya gbuo ya.
GEN 4:9 Emesịa, Onyenwe anyị jụrụ Ken ajụjụ sị, “Ebee ka Ebel nwanne gị nwoke nọ?” Ọ zaghachiri, “Amaghị m. Abụ m onye nche nwanne m?”
GEN 4:10 Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Gịnị ka i mere? Gee ntị, ọbara nwanne gị na-akpọku m site nʼala.
GEN 4:11 Site ugbu a gaa nʼihu ị bụrụla onye a bụrụ ọnụ, na onye e si nʼala chụpụ, ala ahụ meghepụrụ ọnụ ya nabata ọbara nwanne gị, site nʼaka gị.
GEN 4:12 Mgbe ị kụrụ ihe ọbụla nʼime ya, ala agaghị enye gị mkpụrụ ya nʼuju. Site ugbu a gaa nʼihu, ị ga-abụ onye na-awagharị awagharị na onye na-abaghị nʼihe nʼụwa.”
GEN 4:13 Ken zara Onyenwe anyị, “Ntaramahụhụ i nyere m dị ukwuu karịa nke m nwere ike ibu.
GEN 4:14 Ugbu a, abụ m onye i si nʼala ubi ya chụpụ. Abụkwa m onye i si nʼihu gị chụpụ. Bido taa aga m abụ onye na-awagharị awagharị nʼime ụwa. Onye ọbụla hụkwara m ga-egbu m.”
GEN 4:15 Onyenwe anyị zara sị ya, “O nweghị onye ga-egbu gị, nʼihi na aga m atụkwasịrị onye ọbụla metụrụ gị aka ntaramahụhụ okpukpu asaa karịa nke m nyere gị.” Ya mere, Onyenwe anyị kara Ken akara iji gbochie onye ọbụla hụrụ ya igbu ya.
GEN 4:16 Ken sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ gaa biri nʼala Nọd, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Iden.
GEN 4:17 Ken na nwunye ya dinakọrọ, nwunye ya tụụrụ ime mụta nwa nwoke aha ya bụ Enọk. Nʼoge a, Ken nọ na-ewu otu obodo ọ gụrụ Enọk, nke bụ aha nwa ya nwoke.
GEN 4:18 Enọk bụ nna Irad, Irad bụ nna Mehujael, Mehujael bụ nna Metusael, Metusael abụrụ nna Lamek.
GEN 4:19 Lamek lụrụ ụmụ nwanyị abụọ. Aha nwunye ya nke mbụ bụ Ada. Aha nke ọzọ bụ Zila.
GEN 4:20 Ada mụtara Jabal, onye bụ nna ndị na-azụ anụ ụlọ, na ndị na-ebi nʼụlọ ikwu.
GEN 4:21 Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal, onye mbụ bụ nna ndị na-akpọ ụbọ akwara, na ndị na-afụ opi.
GEN 4:22 Zila, mụtara otu nwa nwoke aha ya bụ Tubal Ken, onye bụ nna ndị niile na-akpụ ihe dị iche iche e ji bronz maọbụ igwe kpụọ. Aha nwanne nwanyị Tubal Ken bụ Naama.
GEN 4:23 Lamek kpọrọ ndị nwunye ya sị ha, “Geenụ m ntị, Ada na Zila, unu ndị nwunye Lamek, nụrụ okwu sị m nʼọnụ. Egbuola m otu nwoke nʼihi na ọ merụrụ m ahụ, otu nwokorobịa nʼihi na ọ mehịara m ahụ.
GEN 4:24 Ọ bụrụ na a ga-abọtara Ken ọbọ ugboro asaa, mgbe ahụ, a ga-abọtara Lamek ọbọ iri ugboro asaa na asaa.”
GEN 4:25 Adam na Iiv dinakọrọ ọzọ, Iiv tụụrụ ime mụta nwa nwoke ọ gụrụ Set. Nʼihi na Iiv kwuru sị, “Chineke enyela m nwa nwoke ọzọ nʼọnọdụ Ebel onye Ken gburu.”
GEN 4:26 Set mụtara nwa nwoke gụọ ya Enọsh. Nʼoge ahụ ka ụmụ mmadụ bidoro ịkpọku aha Onyenwe anyị.
GEN 5:1 Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke.
GEN 5:2 O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.
GEN 5:3 Mgbe Adam gbara narị afọ na iri afọ atọ, ọ mụrụ nwa ya nwoke nʼoyiyi nke ya, na nʼụdịdị nke ya. Ọ gụrụ ya Set.
GEN 5:4 Site nʼoge a mụrụ Set, Adam dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 5:5 Adam nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ atọ.
GEN 5:6 Set gbara narị afọ na ise mgbe ọ ghọrọ nna Enọsh,
GEN 5:7 Mgbe ọ ghọchara nna Enọsh, Set dịrị ndụ ruo narị afọ asatọ na asaa ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 5:8 Set nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ na abụọ.
GEN 5:9 Mgbe Enọsh gbara iri afọ itoolu, ọ ghọrọ nna Kenan.
GEN 5:10 Mgbe ọ ghọchara nna Kenan, Enọsh dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ na ise, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 5:11 Enọsh nwụkwara mgbe ọ nọzuru narị afọ itoolu na afọ ise.
GEN 5:12 Mgbe Kenan gbara iri afọ asaa ka ọ ghọrọ nna Mahalalel.
GEN 5:13 Mgbe ọ ghọchara nna Mahalalel, Kenan dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ anọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 5:14 Kenan nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na afọ iri.
GEN 5:15 Mgbe Mahalalel gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Jared.
GEN 5:16 Mgbe ọ ghọchara nna Jared, Mahalalel dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 5:17 Mahalalel nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asatọ na iri afọ itoolu na ise.
GEN 5:18 Mgbe Jared dị narị afọ na iri afọ isii na abụọ ka ọ ghọrọ nna Enọk.
GEN 5:19 Mgbe ọ ghọchara nna Enọk, Jared dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 5:20 Jared nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na abụọ.
GEN 5:21 Mgbe Enọk gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Metusela.
GEN 5:22 Mgbe ọ ghọchara nna Metusela, Enọk soro ụzọ Chineke narị afọ atọ. Nʼoge a, ọ mụtara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 5:23 Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise.
GEN 5:24 Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.
GEN 5:25 Mgbe Metusela gbara narị afọ na iri afọ asatọ na asaa ka ọ ghọrọ nna Lamek.
GEN 5:26 Mgbe ọ ghọchara nna Lamek, Metusela dịrị ndụ narị afọ asaa na iri afọ asatọ na abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 5:27 Metusela nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu.
GEN 5:28 Mgbe Lamek gbara narị afọ na iri afọ asatọ na abụọ ka ọ mụtara nwa nwoke.
GEN 5:29 Lamek gụrụ ya Noa, nʼihi na ọ sịrị: “Ọ ga-akasị anyị obi nʼime oke ọrụ na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ nʼala a Onyenwe anyị bụrụ ọnụ.”
GEN 5:30 Mgbe a mụsịrị Noa, Lamek dịrị ndụ narị afọ ise na iri afọ itoolu na ise ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 5:31 Lamek nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asaa na iri afọ asaa na asaa.
GEN 5:32 Mgbe Noa gbara narị afọ ise ọ ghọrọ nna Shem, Ham na Jafet.
GEN 6:1 Mgbe ndị mmadụ bidoro mụbaa nʼụwa, mgbe a mụtakwaara ha ọtụtụ ụmụ ndị inyom,
GEN 6:2 ka ụmụ ndị ikom Chineke bidoro ilekwasị ụmụ ndị inyom ndị mmadụ anya, hụ na ha mara mma. Ha duuru ndị inyom ọbụla masịrị ha ka ha bụrụ nwunye ha.
GEN 6:3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mmụọ m na mmadụ agaghị anọgide nʼịgba mgba nʼime mmadụ ruo ebighị ebi, nʼihi na mmadụ efu ka ọ bụ. Ọnụọgụgụ ndụ ya ga-abụ narị afọ na iri afọ abụọ.”
GEN 6:4 Ndị Nefilim nọ nʼụwa nʼoge ahụ, ma nʼoge sotere ya mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom Chineke na-abakwuru ndị inyom ụmụ mmadụ, site na mmekọrịta dị otu a mụọ ụmụ. Ndị a bụ ndị dike mgbe ochie ahụ, ndị a ma ama.
GEN 6:5 Onyenwe anyị hụrụ otu ịba ụba nke ajọ omume mmadụ si dị ukwuu, hụkwa na echiche uche nke obi ya niile dị naanị nʼime ihe ọjọọ, mgbe niile.
GEN 6:6 O wutere Onyenwe anyị nke ukwuu na o kere mmadụ, mkpụrụobi ya jupụtakwara nʼihe mgbu.
GEN 6:7 Nʼihi ya, Onyenwe anyị sịrị, “Aga m esi nʼụwa kpochapụ mmadụ niile m kere eke. E e, mmadụ na anụmanụ niile, na ihe e kere eke na-akpụgharị nʼelu ala, na anụ ufe niile. Nʼihi na o wutere m na m kere ha.”
GEN 6:8 Ma Noa nwetara ihuọma nʼanya Onyenwe anyị.
GEN 6:9 Nke a bụ akụkọ banyere usoro ndụ Noa na ezinaụlọ ya. Noa bụ onye ezi omume. Onye na-enweghị ịta ụta ọbụla nʼetiti ndị bi nʼoge ya. O mere ihe nʼụzọ Chineke chọrọ ya.
GEN 6:10 Noa mụtara ụmụ ndị ikom atọ aha ha bụ, Shem, Ham, na Jafet.
GEN 6:11 Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike.
GEN 6:12 Chineke hụrụ otu ụwa si jọgbuo onwe ya na njọ, hụkwa na ụmụ mmadụ bụ ndị ihe ọjọọ riri ahụ.
GEN 6:13 Chineke sịrị Noa, “Aga m ebibi ihe niile bụ mmadụ, nʼihi na ụwa jupụtara nʼihe ike nʼihi omume mmadụ. E e, aga m ebibi ụwa na ndị niile nọ nʼime ya.
GEN 6:14 Ya mere, jiri osisi gofa wuore onwe gị ụgbọ mmiri. Rụnye ọtụtụ ọnụụlọ nʼime ya. Jiri korota techie elu ya na ime ya.
GEN 6:15 Otu a ka i ga-esi wuo ya: mee ka ogologo ụgbọ mmiri ahụ dịrị narị mita na iri mita anọ, obosara ya dịrị iri mita abụọ na atọ, ịdị elu ya dịrị mita iri na atọ na ọkara.
GEN 6:16 Meere ụgbọ mmiri ahụ ihe e ji ekpuchi elu ya. Mekwa oghere ga-adị ọkara mita site nʼebe ihe mkpuchi elu ụgbọ mmiri ahụ gbadata. Tinye ọnụ ụzọ nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, ma rụọkwa okpukpu nkwasa atọ, nke ala ala, nke etiti na nke elu elu.
GEN 6:17 Nʼihi na aga m eweta uju mmiri nʼụwa, ibibi ihe niile nwere ndụ dị nʼokpuru eluigwe. Ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ ga-anwụ. Ihe niile nọ nʼụwa ga-ala nʼiyi.
GEN 6:18 Ma aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị gị. Ị ga-abanye nʼụgbọ mmiri ahụ, gị na ụmụ gị ndị ikom, na nwunye gị, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom.
GEN 6:19 Ị ga-ewebata ihe niile e kere eke dị ndụ, abụọ abụọ, oke na nwunye, ichebe ha ndụ.
GEN 6:20 Ụdị nnụnụ dị iche iche, abụọ abụọ, na ụdị anụmanụ ọbụla dị iche iche, na ụdị anụ na-akpụ akpụ dị iche iche, ga-abịakwute gị ka i debe ha ndụ.
GEN 6:21 Ị ga-ewebata ụdị nri dị iche iche a na-eri eri, chịkọtaa ha ka ọ bụrụ nri nke gị na nke ha.”
GEN 6:22 Noa mere ihe niile dịka Chineke nyere ya iwu ime.
GEN 7:1 Mgbe ụbọchị ahụ zuru, Onyenwe anyị kpọrọ Noa sị ya, “Baa nʼime ụgbọ mmiri, gị na ezinaụlọ gị niile, nʼihi na nʼime ndị niile bi nʼọgbọ a, ọ bụ naanị gị bụ onye ezi omume m hụrụ.
GEN 7:2 Kpọrọ ụmụ anụmanụ ndị a a gụrụ dịka ndị dị ọcha, dịka ụdị ha si dị asaa asaa, oke na nwunye. Otu a kwa, kpọrọkwa ụmụ anụmanụ ndị a gụrụ dịka ndị na-adịghị ọcha, dịka ụdị ha si dị, abụọ abụọ, oke na nwunye,
GEN 7:3 na ụmụ anụ ufe asaa asaa, dịka ụdị ha si dị, oke na nwunye, maka idebe ụdị ndị a niile ndụ nʼụwa.
GEN 7:4 Nʼihi na ụbọchị asaa site taa, aga m ezidata mmiri ozuzo nʼụwa. Mmiri a ga-ezo iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Aga m ekpochapụ site nʼelu ụwa ihe niile nwere ndụ nke m kere.”
GEN 7:5 Ya mere, Noa mere ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
GEN 7:6 Noa gbara narị afọ isii mgbe mmiri ukwu a bidoro izo nʼelu ụwa.
GEN 7:7 Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya ndị ikom ịgbanarị uju mmiri ahụ.
GEN 7:8 Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa,
GEN 7:9 oke na nwunye, bịakwutere Noa soro ya banye nʼụgbọ mmiri ahụ, dịka Chineke nyere Noa nʼiwu.
GEN 7:10 Mgbe abalị asaa gafere, uju mmiri ahụ bịakwasịrị ụwa.
GEN 7:11 Nʼafọ narị isii nke ndụ Noa, nʼọnwa nke abụọ, nʼụbọchị nke iri na asaa, bụ ụbọchị isi iyi niile dị nʼime ime ala nupụtara nʼelu ala, mmiri niile dị na mbara eluigwe ka a hapụrụ ka ha wụdata nʼụwa.
GEN 7:12 Mmiri zogịdere na-esepụghị aka iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
GEN 7:13 Nʼụbọchị ahụ kpomkwem, Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na Shem, Ham na Jafet, bụ ụmụ Noa, na nwunye Noa, na ndị nwunye atọ nke ụmụ ya.
GEN 7:14 Ha onwe ha, na anụ ọhịa ọbụla, nʼụdị ya, na anụ ụlọ ọbụla, nʼụdị ya na ihe ọbụla e kere eke na-akpụgharị nʼala, nʼụdị ya, na anụ ufe ọbụla nʼụdị ya, na aha nnụnụ ọbụla na ihe ọbụla nwere nku.
GEN 7:15 Ha bịakwutere Noa nʼime ụgbọ mmiri ahụ, abụọ abụọ site nʼihe niile ọbụla e kere eke, nke nwere ume ndụ nʼime ha.
GEN 7:16 Ma ndị banyerenụ bụ oke na nwunye, site na ihe niile nwere ndụ dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mechiri ọnụ ụzọ dị nʼụgbọ mmiri ahụ.
GEN 7:17 Uju mmiri nọgidere nʼụwa iri ụbọchị anọ. Mgbe mmiri ndị a na-aba ụba, ha buliri ụgbọ mmiri ahụ elu site nʼelu ala.
GEN 7:18 Mmiri ndị a toro na-ala elu na-abawanyekwa ụba nʼelu ụwa. Ụgbọ mmiri ahụ segooro nʼelu mmiri.
GEN 7:19 Mmiri ndị ahụ toro laa elu kpuchie ugwu ukwu niile dị nʼokpuru mbara eluigwe.
GEN 7:20 Mmiri ndị a toro kpuchiri ugwu niile, ruo na ịla elu mmiri ndị a site nʼelu ugwu ukwu niile ruru mita asaa.
GEN 7:21 Ihe niile nwere ndụ nke na-ejegharị nʼelu ụwa kubiri ume. Anụ ufe, na anụ ụlọ, na anụ ọhịa, na ihe niile e kere eke jupụtara nʼụwa, na ụmụ mmadụ niile.
GEN 7:22 Ee, ihe niile na-eku ume nke bi nʼelu ala nwụrụ.
GEN 7:23 Ihe niile nwere ume ndụ nʼelu ụwa ka e kpochapụrụ. Mmadụ na anụmanụ, na anụ na-akpụgharị nʼala na nnụnụ niile. A lara ha niile nʼiyi. Ma ọ bụ naanị Noa na ndị niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ ka a hapụrụ ndụ.
GEN 7:24 Narị ụbọchị na iri ụbọchị ise ka mmiri dọọrọ nʼelu ụwa dum.
GEN 8:1 Ma Chineke chetara Noa na ụmụ anụ ọhịa niile, na ụmụ anụ ụlọ niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ. O zitere ifufe, mee ka o fee nʼelu mmiri ahụ ime ka mmiri ahụ bido ịta.
GEN 8:2 A kpọchiri isi iyi mmiri niile dị nʼime ime ala, kpọchiekwa ọnụ ụzọ mmiri ozuzo nke mbara eluigwe. Mmiri kwụsịrị isi na mbara eluigwe na-ezokwasị ụwa.
GEN 8:3 Mmiri ahụ dị nʼụwa ji nwayọọ na-ata. Mgbe narị ụbọchị na iri ụbọchị ise gafesịrị, mmiri ahụ atalatala.
GEN 8:4 Nʼụbọchị iri na asaa nke ọnwa asaa, ụgbọ mmiri ahụ gara nọkwasị nʼelu ugwu Ararat.
GEN 8:5 Mmiri a gara nʼihu na-ata ruo ọnwa nke iri. Nʼụbọchị nke mbụ nke ọnwa iri, e bidoro ịhụ elu ugwu ndị ọzọ anya.
GEN 8:6 Mgbe iri ụbọchị anọ gafere, Noa meghere oghereikuku ọ rụnyere nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ,
GEN 8:7 site nʼebe ahụ zipụ otu ugolọma nke na-efepụ na-efebatakwa, tutu ruo mgbe mmiri kọrọ nʼelu ala.
GEN 8:8 Emesịa, o zipụrụ otu nduru iji mata ma mmiri ọ kọọla nʼala,
GEN 8:9 ma nduru ahụ achọtaghị ebe o nwere ike ibe, nʼihi na mmiri ka tojuru elu ụwa niile. Nʼihi ya, nduru ahụ lọghachikwutere Noa nʼime ụgbọ ahụ. Noa setịpụrụ aka ya nwụbata nduru ahụ nʼụgbọ.
GEN 8:10 Mgbe abalị asaa gafere, Noa zipụrụ nduru ahụ ọzọ
GEN 8:11 Nʼoge anyasị, nduru a lọghachiri. Ọ kpụ akwụkwọ oliv ọhụrụ ọ kụbitere nʼọnụ ya. Nke a gosiri Noa na mmiri ahụ ataala nʼelu ala.
GEN 8:12 Mgbe abalị asaa gafere, Noa zipụkwara nduru ahụ ọzọ. Ma nʼoge a, ọ lọtakwaghị ọzọ.
GEN 8:13 Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ narị isii na otu nke ndụ Noa, mmiri ahụ atachaala nʼelu ala. Mgbe ahụ, Noa kpughepụrụ ihe mkpuchi nke ụgbọ mmiri ahụ, hụ na mmiri atachaala nʼelu ala.
GEN 8:14 Ma ọ bụ nʼụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa abụọ ka mmiri ji takọrọchaa nʼelu ala.
GEN 8:15 Mgbe ahụ, Chineke gwara Noa okwu sị ya,
GEN 8:16 “Site nʼụgbọ mmiri pụta, gị na nwunye gị, na ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom.
GEN 8:17 Kpọpụta anụ niile dị ndụ nke gị na ha nọ, anụ ufe, na ụmụ anụmanụ, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, ka ha gaa nʼụwa mụọ ọmụmụ, baa ụba, jupụta nʼelu ya.”
GEN 8:18 Ya mere, Noa si nʼụgbọ mmiri ahụ pụta, ya na ụmụ ya, na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya.
GEN 8:19 Ma anụmanụ niile ọbụla nke dị ndụ, na ihe niile na-akpụgharị nʼala, na anụ ufe niile, ihe niile na-ejegharị nʼụwa, ka ụdị ha si dị, sitere nʼụgbọ mmiri ahụ pụta.
GEN 8:20 Mgbe ahụ, Noa wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. Ọ họọrọ site nʼanụ ụlọ ndị dị ọcha na anụ ufe ndị dị ọcha chụọ aja nsure ọkụ.
GEN 8:21 Onyenwe anyị nụrụ isisi ụtọ nke aja nsure ọkụ ahụ kwuo nʼobi ya sị, “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ nʼihi mmadụ, ebe ọ bụ na izuzu obi mmadụ bụ ime ihe ọjọọ site na mgbe ọ bụ nwata, agakwaghị m ala ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ iyi ọzọ, dịka m mere.
GEN 8:22 “Ogologo oge niile ụwa ga-anọgide, oge ịkụ mkpụrụ na oge iwe ihe ubi, oge oyi na oge okpomọkụ, ọkọchị na udu mmiri, ehihie na abalị, agaghị ebi.”
GEN 9:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke gọziri Noa na ụmụ ya sị ha: “Mụọnụ, baanụ, jupụtanụ nʼụwa.
GEN 9:2 Egwu unu na ụjọ unu ga-adakwasị anụmanụ niile nke ụwa nke dị ndụ, na anụ ufe niile nke eluigwe, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, na azụ niile dị nʼosimiri. Ewerela m ha niile nyefee unu nʼaka.
GEN 9:3 Ihe ọbụla dị ndụ nke na-ejegharị ejegharị ga-abụ nri unu. Enyela m unu ihe niile ugbu a dịka m si nye unu ahịhịa ndụ niile.
GEN 9:4 “Ma unu agaghị eri anụ ọbụla nke ọbara ndụ ya dị ya nʼahụ.
GEN 9:5 Ma gbasara ọbara ndụ unu, unu ga-asara ọnụ unu nʼihu m. Anụmanụ ọbụla ga-asara ọnụ ya nʼihu m. Mmadụ ọbụla kwa ga-asara ọnụ ya nʼihu m banyere ndụ mmadụ ibe ya.
GEN 9:6 “Onye ọbụla wufuru ọbara mmadụ, nʼaka mmadụ ka a ga-awụfu ọbara nke ya, nʼihi nʼoyiyi Chineke ka Chineke mere mmadụ.
GEN 9:7 Ma unu onwe unu, mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ ụwa, baakwanụ ụba nʼime ya.”
GEN 9:8 Chineke gwara Noa na ụmụ ya sị,
GEN 9:9 “Ugbu a, ana m ehiwe ọgbụgba ndụ nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti agbụrụ unu ndị ga-anọchi unu,
GEN 9:10 na nʼetiti ihe niile nwere ndụ nke unu na ha so, ụmụ anụ ufe, na ụmụ anụ ụlọ, na ụmụ anụ ọhịa niile, ndị ahụ niile so unu si nʼụgbọ mmiri pụta, bụ ihe niile nwere ndụ nʼụwa.
GEN 9:11 Ebe ọ bụ na m ehiwela ọgbụgba ndụ m nʼetiti mụ na unu, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri kpochapụ ihe niile e kere eke, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri bibie ụwa.”
GEN 9:12 Chineke kwuru sị, “Nke a bụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ nke m na-etinye nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti ihe niile nwere ndụ so unu, ọgbụgba ndụ nke ga-adị nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu.
GEN 9:13 Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa.
GEN 9:14 Mgbe ọbụla m zitere igwe ojii nʼụwa, ọ bụrụ na eke na egwurugwu apụta ìhè na mbara eluigwe,
GEN 9:15 aga m echeta ọgbụgba ndụ m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke. Ọ gaghị emekwa ọzọ na mmiri ga-aghọ uju mmiri ibibi ihe niile nwere ndụ.
GEN 9:16 Mgbe ọbụla eke na egwurugwu pụtara nʼigwe ojii, aga m ahụ ya cheta ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke dị nʼetiti Chineke na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke nọ nʼelu ụwa.”
GEN 9:17 Chineke gwara Noa sị, “Nke a bụ ihe ama ọgbụgba ndụ ahụ m hiwere nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ nʼụwa.”
GEN 9:18 Ụmụ ndị ikom Noa ndị si nʼụgbọ mmiri pụta bụ Shem, Ham na Jafet. (Ham bụ nna Kenan.)
GEN 9:19 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ọ bụ site na ha ka ndị mmadụ niile gbasara nʼụwa niile si pụta.
GEN 9:20 Noa, onye ọrụ ubi, bidoro ịkụ ubi vaịnị a gbara ogige.
GEN 9:21 Mgbe ọ ṅụrụ mmanya si nʼubi a, ṅụbiga ya oke, ọ gbaara ọtọ dinaa ala nʼime ụlọ ikwu ya.
GEN 9:22 Ham, nna Kenan, hụrụ ọtọ nna ya, gaa kọọrọ ụmụnne ya abụọ nọ nʼezi ihe ọ hụrụ.
GEN 9:23 Ma Shem na Jafet weere akwa tụkwasị nʼubu ha, were azụ jere ije ruo nʼebe nna ha nọ, hapụ akwa ahụ ka ọ dakwasị nna ha kpuchikwaa ọtọ ya. Ma ha chepuru ihu nʼebe ọzọ mgbe ha na-eme nke a, nʼihi ya, ha elekwasịghị ọtọ nna ha anya.
GEN 9:24 Mgbe Noa si nʼụra mmanya ya bilie, chọpụta ihe nwa ya nwoke nke nta mere,
GEN 9:25 o kwuru sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka Kenan bụ! Ohu ndị ohu, ka ọ ga-abụrụ ụmụnne ya.”
GEN 9:26 Ọ sịkwara, “Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke Shem. Ka Kenan bụrụ ohu Shem.
GEN 9:27 Ka Chineke mee ka ebe obibi Jafet saa mbara, ka Jafet biri nʼụlọ ikwu Shem, meekwa ka Kenan bụrụ ohu ya.”
GEN 9:28 Mgbe uju mmiri ahụ gabigachara, Noa biri ndụ narị afọ atọ na iri afọ ise ọzọ.
GEN 9:29 Ọnụọgụgụ afọ Noa niile mgbe ọ nwụrụ, bụ narị afọ itoolu na iri afọ ise.
GEN 10:1 Ndị a bụ akụkọ banyere Shem, Ham na Jafet, ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ha onwe ha mụtara ụmụ nke aka ha, mgbe uju mmiri gafesịrị.
GEN 10:2 Ụmụ ndị ikom Jafet bụ: Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras.
GEN 10:3 Ụmụ ndị ikom Goma bụ: Ashkenaz, Rifat na Togama.
GEN 10:4 Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim na Rodanim.
GEN 10:5 (Site nʼagbụrụ ndị a bi nʼakụkụ mmiri ka e nwetara mba dị iche iche, nʼagbụrụ ha nʼime obodo ha dị iche iche, ndị ọbụla nʼime ha nwekwara asụsụ nke ha.)
GEN 10:6 Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan.
GEN 10:7 Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan.
GEN 10:8 Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa.
GEN 10:9 Ọ bụ dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere e ji na-ekwu okwu na-asị, “Ị dị ka Nimrọd, dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị.”
GEN 10:10 Obodo ndị bụ mmalite alaeze ya bụ, Babel, Erek, Akad na Kalne, ndị dị nʼala Shaịna.
GEN 10:11 Site nʼala ahụ ọ gara Asịrịa, ebe o wuru obodo Ninive na Rehobọt Ia, na Kala,
GEN 10:12 na Resin, nke dị nʼetiti Ninive na Kala, ya bụ obodo ukwu ahụ.
GEN 10:13 Ijipt bụ nna ndị Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh,
GEN 10:14 ndị Patrus, ndị Kasluh (onye ndị Filistia sitere na ya) na ndị Kafto.
GEN 10:15 Kenan bụ nna Saịdọn, ọkpara ya, na ndị Het,
GEN 10:16 ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash,
GEN 10:17 ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini,
GEN 10:18 ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat. Emesịa, ndị ikwu Kenan gbasara,
GEN 10:19 oke ala ndị Kenan sitere na Saịdọn ruo Gera, gbatịa ruo Gaza, ruokwa Sọdọm, Gọmọra, Adma na Zeboiim, nke dị nso Lasha.
GEN 10:20 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ham, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha bi, na obodo ha dị iche iche.
GEN 10:21 A mụụrụ Shem ụmụ ndị ikom, onye nwanne nwoke nke tọrọ ya bụ Jafet. Ọ bụkwa nna nna ochie ụmụ ndị ikom niile Eba mụtara.
GEN 10:22 Ụmụ ndị ikom Shem bụ Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram.
GEN 10:23 Ụmụ ndị ikom Aram bụ, Uz, Hul, Geta na Meshek.
GEN 10:24 Apakshad bụ nna Shela, Shela bụrụ nna Eba.
GEN 10:25 Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Aha otu nʼime ha bụ Peleg, nʼihi na ọ bụ nʼoge ndụ ya ka e kewara ụwa. Aha nwanne ya nwoke bụ Joktan.
GEN 10:26 Joktan bụ nna Almodad, Shelef, Hazamavet, Jera,
GEN 10:27 Hadoram, Ụzal, Dikla,
GEN 10:28 Obal, Abimael, Sheba,
GEN 10:29 Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan.
GEN 10:30 Akụkụ ala ha bi gbasapụrụ site na Mesha ruo Sefa nʼala ugwu ugwu nke ọwụwa anyanwụ.
GEN 10:31 Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Shem, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha dị, na obodo ha dị iche iche.
GEN 10:32 Ndị a bụ ndị ikwu ụmụ Noa ndị ikom dịka usoro ọmụmụ ha si dị, dịka ha si biri na mba dị iche iche. Ọ bụ site na ndị a ka mba niile si gbasasịa ruo akụkụ niile nke ụwa mgbe uju mmiri ahụ gafechara.
GEN 11:1 Nʼoge ahụ, ụwa niile nwere naanị otu asụsụ, okwu niile bụkwa otu.
GEN 11:2 Mgbe ndị mmadụ gbasara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ha chọtara ala dị larịị na Shaịna biri nʼebe ahụ.
GEN 11:3 Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Bịanụ ka anyị kpụọ brik, kpọọ ha ọkụ nke ọma.” Ya mere, ha kpụrụ brik kama nkume, jirikwa bitumen kama ụrọ.
GEN 11:4 Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị wuore onwe anyị obodo na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru nʼeluigwe, ka anyị si otu a meere onwe anyị aha, ka anyị ghara ịbụ ndị a ga-agbasa nʼụwa niile.”
GEN 11:5 Onyenwe anyị rịdatara hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ na-ewu.
GEN 11:6 Onyenwe anyị sịrị, “Lee! Ọ bụrụ na ha malitere ime ihe dị otu a, ugbu a ha bụ otu ndị, nweekwa otu asụsụ, o nweghị ihe ha zubere ime nke ha na-apụghị ime.
GEN 11:7 Ngwa, ka anyị rịda gaa gbarụọ asụsụ ha, ka onye o bụla ghara ịghọta asụsụ ibe ya.”
GEN 11:8 Onyenwe anyị mere ka ha gbasaa nʼelu ụwa niile. Ha kwụsịkwara iwu obodo ahụ.
GEN 11:9 Ọ bụkwa nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị wetara ọgbaaghara nʼasụsụ ndị niile bi nʼụwa. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị si gbasasịa ha nʼelu ụwa dum.
GEN 11:10 Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Shem. Mgbe afọ abụọ gafechara site nʼoge uju mmiri ahụ, nʼoge Shem gbara narị afọ, ọ mụtara Apakshad.
GEN 11:11 Shem dịrị ndụ, mgbe ọ mụsịrị Apakshad, narị afọ ise ọzọ, mụtakwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 11:12 Mgbe Apakshad gbara iri afọ atọ na ise, ọ mụtara Shela.
GEN 11:13 Mgbe ọ mụchara Shela, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 11:14 Shela gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ nwa ya nwoke Eba.
GEN 11:15 Mgbe ọ ghọrọ nna Eba, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 11:16 Eba gbara iri afọ atọ na anọ mgbe ọ mụrụ Peleg.
GEN 11:17 Mgbe ọ ghọrọ nna Peleg, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na iri atọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 11:18 Peleg gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Reu.
GEN 11:19 Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Reu, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na itoolu ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 11:20 Reu gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ mụrụ Serug.
GEN 11:21 Emesịa, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na asaa ọzọ, mgbe ọ mụsịrị Serug, ọ mụtakwara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 11:22 Serug gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Nahọ.
GEN 11:23 Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Nahọ, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 11:24 Nahọ gbara iri afọ abụọ na itoolu mgbe ọ mụrụ Tera.
GEN 11:25 Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Tera, ọ dịrị ndụ narị afọ na afọ iri na itoolu ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
GEN 11:26 Mgbe Tera gbara iri afọ asaa, ọ ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran.
GEN 11:27 Nke a bụ akụkọ gbasara usoro ezinaụlọ Tera. Tera ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. Haran ghọrọ nna Lọt.
GEN 11:28 Haran nwụrụ nʼihu nna ya Tera nʼala ebe a nọ mụọ ya, nke bụ na Ụọ, obodo ndị Kaldịa.
GEN 11:29 Ebram na Nahọ lụrụ nwunye. Aha nwunye Ebram bụ Serai ma aha nwunye Nahọ bụ Milka. Milka bụ nwa Haran, onye bụ nna Milka na Iska.
GEN 11:30 Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla.
GEN 11:31 Tera kpọrọ nwa ya Ebram, na nwa nwa ya Lọt, onye bụ nwa Haran, na nwunye nwa ya Serai, bụ nwunye Ebram, duru ha hapụ Ụọ, obodo ndị Kaldịa, pụọ gawa nʼala Kenan. Ma mgbe ha bịarutere nʼobodo Haran, ha kwụsịrị biri nʼebe ahụ.
GEN 11:32 Ọ bụ nʼobodo Haran ka Tera nọ nwụọ, mgbe ọ gbara narị afọ abụọ na ise.
GEN 12:1 Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị, “Site nʼobodo gị, sikwa na ụmụnna gị na ezinaụlọ nna gị, gaa nʼala m ga-egosi gị.
GEN 12:2 “Aga m eme gị mba ukwu, aga m agọzi gị, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, ị ga-abụ ngọzị.
GEN 12:3 Aga m agọzi ndị na-agọzi gị, ma onye ọbụla kọchara gị ka m ga-akọcha; a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.”
GEN 12:4 Ya mere, Ebram hapụrụ gaa dịka Onyenwe anyị gwara ya. Lọt sokwa ya. Ebram agbaala iri afọ asaa na ise mgbe o si na Haran bulie ije.
GEN 12:5 O duru nwunye ya Serai na Lọt nwa nwanne ya, chịkọtakwa akụ niile ha kpakọbara, na ndị ohu niile ha nwetara nʼala Haran, chee ihu ịga nʼala Kenan. Emesịa ha rutere nʼebe ahụ.
GEN 12:6 Ebram jere ije nʼime ala Kenan jeruo nʼebe osisi ukwu More, nke dị nʼobodo Shekem. Ndị Kenan bi nʼala ahụ nʼoge ahụ.
GEN 12:7 Onyenwe anyị mere ka Ebram hụ ya anya, ọ sịrị, “Aga m enye mkpụrụ gị ala a.” Ya mere, Ebram wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ nye Onyenwe anyị onye gosiri ya onwe ya.
GEN 12:8 Emesịa, Ebram hapụrụ ebe ahụ chee ihu nʼala ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Betel, maa ụlọ ikwu ya. Obodo Betel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ma obodo Ai dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ebe ọ mara ụlọ ikwu ya. Nʼebe nsọ ahụ Ebram wuru ebe ịchụ aja, nọrọ nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị.
GEN 12:9 Ọzọ, Ebram si nʼebe ahụ pụọ gaa ije rute Negev.
GEN 12:10 Nʼoge ahụ, oke ụnwụ dara nʼala ahụ. Nʼihi ya, Ebram hapụrụ ala ahụ gaa nʼala Ijipt, ebe o biri nwa oge.
GEN 12:11 Ma mgbe ha na-akwado ịbanye ala Ijipt, ọ gwara Serai nwunye ya sị, “Amaara m na ị bụ nwanyị mara mma.
GEN 12:12 Mgbe ndị Ijipt ga-ahụ gị, ha ga-asị, ‘Onye a bụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, ha ga-egbu m ma hapụ gị ndụ.
GEN 12:13 Gwa ha na ị bụ nwanne m nwanyị, ka ha meso m mmeso ọma nʼihi gị. Ha ga-echebekwa m ndụ nʼihi gị.”
GEN 12:14 Mgbe Ebram rutere Ijipt, ndị Ijipt hụrụ na nwunye ya bụ nwanyị mara mma.
GEN 12:15 Mgbe ndị ozi Fero hụrụ ya, ha toro ya nʼihu Fero. Nʼihi nke a, ha kpọbatara Serai nʼụlọeze Fero.
GEN 12:16 Fero mesoro Ebram mmeso ọma nʼihi nwunye ya. Ebram nwetara igwe atụrụ, na ehi, na nne ịnyịnya ibu, oke na nwunye, na ndị ohu ndị nwoke na ndị nwanyị, na ịnyịnya kamel.
GEN 12:17 Ma Onyenwe anyị jiri ajọọ ọrịa tie Fero na ndị ezinaụlọ ya ihe otiti nʼihi Serai nwunye Ebram.
GEN 12:18 Mgbe ahụ, Fero kpọrọ Ebram sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere? Gịnị mere ị gwaghị m na ọ bụ nwunye gị?
GEN 12:19 Gịnị mere i ji sị na ọ bụ nwanne gị nwanyị, si otu a mee m ka m kpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye m? Ugbu a, lee nwunye gị, kpọrọ ya laa.”
GEN 12:20 Fero nyere iwu banyere Ebram na ndị ikom so ya. Ha zilagara ya, ya na nwunye ya, na ihe niile o nwere.
GEN 13:1 Ebram na nwunye, na ihe niile ha nwere hapụrụ ala Ijipt, gaa ije bịaruo Negev. Lọt sokwa ha.
GEN 13:2 Nʼoge a, Ebram aghọọla ọgaranya dị ukwuu, onye nwere akụnụba nke ọtụtụ anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo.
GEN 13:3 Ha sitere na Negev pụọ ije site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu ha erute Betel, nʼebe dị nʼetiti Betel na Ai, ebe ọ mara ụlọ ikwu ya na mbụ.
GEN 13:4 Nʼebe nsọ o wukwara ebe ịchụ aja na mbụ, nʼebe ahụ Ebram kpọkuru aha Onyenwe anyị.
GEN 13:5 Ugbu a Lọt, onye ya na Ebram so na njem ya, bụkwa onye nwere akụnụba nke igwe ewu na atụrụ, na igwe ehi, na ọtụtụ ụlọ ikwu.
GEN 13:6 Ma ala ebe ha nọ ezurughị ha mgbe ha nọkọrọ ọnụ nʼihi na ihe onwunwe ha dị ukwuu ruo na ha enweghị ike ịnọkọ ọnụ.
GEN 13:7 Nke a mere esemokwu ji dapụta nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ Ebram na ndị ọzụzụ anụ ụlọ Lọt. Ndị Kenan na ndị Periz bikwa nʼala ahụ nʼoge ahụ.
GEN 13:8 Ya mere Ebram gwara Lọt sị, “Biko, ka esemokwu ghara ịdị nʼetiti mụ na gị, maọbụ nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ gị, nʼihi na anyị bụ ụmụnne.
GEN 13:9 Lee, ọ bụ na ala a niile adịghị nʼihu gị? Ka anyị kewaa. Ọ bụrụ na ị gaa nʼakụkụ aka ekpe, aga m aga nʼakụkụ aka nri. Ma ọ bụrụ na i gaa nʼakụkụ aka nri gị, aga m aga nʼakụkụ aka ekpe.”
GEN 13:10 Lọt lelitere anya hụ na mbara ala Jọdan bụ ala mmiri na-ezokwasị nke ọma, ala dịka ubi a gbara ogige Onyenwe anyị, dịka ala ndị Ijipt nke dị na nso nso Zoa. (Ihe a mere tupu Onyenwe anyị ebibie obodo Sọdọm na Gọmọra.)
GEN 13:11 Ya mere, Lọt họọrọ nye onwe ya mbara ala Jọdan niile, chee ihu ịga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ya na Ebram kewara.
GEN 13:12 Ebram nọdụrụ nʼala Kenan, ma Lọt gara biri nʼetiti obodo ndị ahụ dị na mbara ala. Ọ mara ụlọ ikwu ya nso nso obodo Sọdọm.
GEN 13:13 Ma ndị Sọdọm bụ ndị obi tara mmiri, ndị na-emehie nke ukwuu megide Onyenwe anyị.
GEN 13:14 Mgbe Lọt siri nʼebe ahụ pụọ, Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị ya, “Site nʼebe ahụ ị nọ lelie anya gị, lee anya nʼugwu na ndịda, nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.
GEN 13:15 Ala ahụ niile ị hụrụ ka m ga-enye gị na mkpụrụ gị ruo mgbe ebighị ebi.
GEN 13:16 Aga m eme ka mkpụrụ gị baa ụba dịka aja dị nʼala. Ọ bụrụ na mmadụ enwe ike ịgụta ọnụọgụgụ aja dị nʼala, ha ga-enwe ike gụta ọnụọgụgụ mkpụrụ gị.
GEN 13:17 Bilie jegharịa nʼala ahụ niile nʼakụkụ ya ọbụla, nʼihi na ana m enye gị ha niile.”
GEN 13:18 Ya mere, Ebram bugharịrị ụlọ ikwu ya, gaa biri nʼakụkụ osisi ukwu Mamre nke dị na Hebrọn. O wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị nʼebe ahụ.
GEN 14:1 Nʼoge ahụ kwa, Amrafel, eze Shaịna, na Ariok, eze ndị Elasa, na Kedoloma eze Elam, na Tidal eze Goiim,
GEN 14:2 buru agha megide Bera eze Sọdọm, na Biasha eze Gọmọra, na Shịnab, eze Adma, na Shemeba eze Zeboiim, na eze obodo Bela (ya bụ Zoa).
GEN 14:3 Ndị eze obodo ndị a: Sọdọm, Gọmọra, Adma, Zeboiim na Bela, jikọtara ndị agha ha ọnụ na Ndagwurugwu Sidim (ya bụ, ndagwurugwu osimiri nnu ahụ).
GEN 14:4 Ha fere ofufe nʼokpuru ọchịchị eze Kedoloma afọ iri na abụọ, ma nʼafọ nke iri na atọ, ha nupuru isi.
GEN 14:5 Nʼafọ nke iri na anọ, eze Kedoloma na ndị eze ya na ha jikọrọ ọnụ buru agha megide ma merie ndị Refaim bi nʼAshterọt Kenaim na ndị Zuzim bi na Ham na ndị Emim bi Kiriatem na Shave,
GEN 14:6 na ndị Hor nʼobodo ugwu Sia, ruo obodo El Paran, nke dị nʼakụkụ ọzara.
GEN 14:7 Mgbe ahụ, ha chigharịrị azụ gaa En Mishpat (ya bụ Kadesh). Ha meriri ala niile nke ndị Amalek nakwa ndị Amọrait bi na Hazezọn Tama.
GEN 14:8 Mgbe ahụ kwa, ndị agha ndị eze obodo Sọdọm na eze Gọmọra, na eze Adma, na eze Zeboiim, na eze Bela (ya bụ Zoa) pụrụ doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Sidim,
GEN 14:9 imegide Kedoloma eze Elam, Tidal eze Goiim, Amrafel eze Shaịna na Ariok eze Elasa. Ya bụ eze ise buru agha megide eze anọ.
GEN 14:10 Ma Ndagwurugwu Sidim jupụtara nʼolulu apịtị. Mgbe ndị agha eze Sọdọm na Gọmọra bidoro ịgba ọsọ. Ụfọdụ nʼime ha dabanyere nʼime olulu ndị a, ma ndị fọdụrụ gbapụrụ ọsọ gbaga nʼugwu.
GEN 14:11 Ma eze anọ ndị a banyere nʼime obodo Sọdọm na Gọmọra bukọrọ akụ ha, na ihe oriri ha niile laa.
GEN 14:12 Ha buuru Lọt, nwa nwanne Ebram, onye bi na Sọdọm na ihe niile o nwere, buru ha na-ala ebe ha si bịa.
GEN 14:13 Ma otu onye gbara ọsọ ndụ site nʼebe ahụ gara kọọrọ Ebram onye Hibru ihe mere. Nʼoge a, Ebram bi nʼebe dị nso nʼosisi ukwu nke Mamre, onye Amọrị, nwanne Eshkọl na Anea, ndị ha na Ebram gbara ndụ.
GEN 14:14 Mgbe Ebram nụrụ na adọrọla Lọt nwa nwanne ya nʼagha, ọ kpọkọtara ndị ikom a zụrụ azụ na-ejere ya ozi, ndị a mụrụ nʼụlọ ya. Ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom atọ na iri na asatọ, ha chụrụ ndị agha ahụ ọsọ tutu ha erute Dan.
GEN 14:15 Nʼabalị, Ebram kere ndị agha ya ibuso ndị ahụ agha. O meriri ha, chụọ ha ọsọ, chụruo ha Hoba, nke dị nʼakụkụ ugwu Damaskọs.
GEN 14:16 Ebram nwetaghachiri ihe niile ahụ ha dọtara nʼagha, dulata nwanne ya Lọt, na ihe onwunwe ya niile, tinyere ndị inyom, na ndị ọzọ niile a dọtara nʼagha.
GEN 14:17 Mgbe Ebram si na mmeri ahụ o meriri Kedoloma na eze ndị ọzọ ahụ na-alọta, eze Sọdọm bịara zute ya na Ndagwurugwu Shave (nke a na-akpọ Ndagwurugwu Eze).
GEN 14:18 Melkizedek, eze Salem, onye nchụaja Chineke nke kachasị ihe niile elu, wepụtara achịcha na mmanya,
GEN 14:19 ọ gọziri Ebram sị ya, “Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa.
GEN 14:20 Ngọzị dịkwara Chineke nke kachasị ihe niile elu, onye weere ndị iro gị nyefee gị nʼaka.” Mgbe ahụ, Ebram nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile.
GEN 14:21 Eze Sọdọm gwara Ebram sị, “Nyeghachi m naanị ndị mmadụ, ma debere onwe gị ihe ndị ọzọ.”
GEN 14:22 Ma Ebram zara eze Sọdọm sị, “Eweliri m aka m elu ṅụọ iyi nye Onyenwe anyị Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa, sị
GEN 14:23 na agaghị m esi nʼaka gị were ihe ọbụla bụ nke gị, ọ bụladị eriri maọbụ eriri akpụkpọụkwụ. Ka ị ghara ị sị, ‘Ọ bụ m mere ka Ebram baa ọgaranya.’
GEN 14:24 Naanị ihe m ga-anara bụ ihe ụmụ okorobịa m ndị a riri, ya na oke ruuru Anea, na Eshkọl, na Mamre so m gaa. Nye ha oke ruuru ha.”
GEN 15:1 Mgbe nke a gasịrị, okwu Onyenwe anyị ruru Ebram site nʼọhụ, sị ya, “Atụla egwu, Ebram Abụ m ọta gị, ụgwọ ọrụ dị ukwu nke i nwere.”
GEN 15:2 Ma Ebram zara sị ya, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnị bụ ihe ị ga-enye m ebe ọ bụ na m amụtaghị nwa? Lee, ọ bụ Elieza, onye Damaskọs, ga-eketa akụ m niile.”
GEN 15:3 Ebram gara nʼihu kwuo sị, “Ebe ọ bụ na m amụtaghị ụmụ, ọ bụ ohu nọ nʼụlọ m ga-eketa akụ m.”
GEN 15:4 Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya, “Nwoke a agaghị eketa ihe i nwere, kama nwa nwoke nke ga-esi nʼahụ gị pụta ga-eketa ihe i nwere.”
GEN 15:5 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọpụtara Ebram nʼezi sị ya, “Lelie anya gị elu na mbara eluigwe, gụọ kpakpando niile ị hụrụ ọnụ, ma ị ga-enwe ike ịgụta ha.” Ọ gwara ya sị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. A gaghị agụta ha ọnụ.”
GEN 15:6 Ebram kweere nʼihe Onyenwe anyị kwuru. Nʼihi nke a, a gụnyere ya okwukwe a dịka ezi omume.
GEN 15:7 Onyenwe anyị gwakwara ya sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye si nʼala Ụọ nke ndị Kaldịa kpọpụta gị, inye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nweta gị.”
GEN 15:8 Ma Ebram zara sị, “Biko, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị olee otu m ga-esi mara na m ga-enweta ya?”
GEN 15:9 Onyenwe anyị zara sị ya, “Wetara m nwa nne ehi gbara afọ atọ, na nne ewu gbara afọ atọ, na ebule gbara afọ atọ, na nduru, na nwa kpalakwukwu.”
GEN 15:10 Ebram wetaara ya ihe ndị a niile bọwaa ha ụzọ abụọ, doo ha nʼusoro ka otu akụkụ chee akụkụ nke ọzọ ihu. Ma ọ bọwaghị ụmụ nnụnụ ndị ahụ.
GEN 15:11 Mgbe anụ ufe fekwasịrị ozu anụ ndị ahụ, Ebram chụpụrụ ha.
GEN 15:12 Mgbe anwụ bidoro ịda, Ebram dara nʼoke ụra, oke ụjọ na oke ọchịchịrị dakwasịrị ya.
GEN 15:13 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara ya sị, “Mata nke ọma na ụmụ ụmụ gị ga-anọ dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha. A ga-edo ha ọnọdụ dịka ndị ohu, mejọọ ha narị afọ anọ.
GEN 15:14 Ma aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ. Nʼikpeazụ, ha ga-eji ọtụtụ akụ si nʼebe ahụ pụta.
GEN 15:15 Ma ị ga-anwụ nʼudo. A ga-eli gị mgbe ị kara ezi nka.
GEN 15:16 Mgbe ọgbọ anọ gasịrị, ụmụ ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala a. Nʼihi na mmehie ndị Amọrait erubeghị nʼuju ya.”
GEN 15:17 Mgbe anwụ dara, mgbe ọchịchịrị gbachiri ebe niile, ite ọkụ na-akwụ anwụrụ ọkụ nke nwere ọwa na-enwu ọkụ si nʼetiti ibe anụ ndị ahụ gafee.
GEN 15:18 Nʼụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị na Ebram gbara ndụ. Ọ sị, “Ndị agbụrụ gị ka m ga-enye ala ndị a, malite nʼiyi ndị Ijipt ruo nʼiyi ukwu Yufretis.
GEN 15:19 Ala ndị Ken, na nke ndị Keniz, na nke ndị Kadmọn,
GEN 15:20 na ala ndị Het, na nke ndị Periz na nke ndị Refaim,
GEN 15:21 na ala ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Gigash na nke ndị Jebus.”
GEN 16:1 Ma Serai nwunye Ebram, amụtaghị nwa. Serai nwere odibo nwanyị onye Ijipt, aha ya bụ Hega.
GEN 16:2 Ya mere ọ gwara Ebram sị, “Lee, ugbu a, Onyenwe anyị egbochiela m ịmụta ụmụ. Ugbu a, bakwuru nwanyị na-ejere m ozi. Ma eleghị anya, aga m esi na ya wulite ezinaụlọ m.” Ebram kweere ihe Serai kwuru.
GEN 16:3 Ya mere Serai nwunye Ebram, duuru Hega, odibo nwanyị ya, onye Ijipt, dunye Ebram ka ọ bụrụ nwunye ya. Ihe a mere na ngwụcha afọ iri site na mgbe Ebram bịara biri nʼala Kenan.
GEN 16:4 Ebram na Hega dinara. Hega tụụrụ ime. Ma mgbe Hega matara na ọ dịrịla ime, ọ malitere ileda nne ya ukwu bụ Serai anya.
GEN 16:5 Mgbe ahụ, Serai gwara Ebram sị, “Ọ bụ gị butere ahụhụ a m nọ nʼime ya. Ọ bụ m were nwaodibo nwanyị m kunye gị nʼaka, ma ugbu a ọ hụrụ na ọ dị ime, abụrụla m onye ọ na-eleda anya. Ka Onyenwe anyị kpee ikpe a nʼetiti mụ na gị.”
GEN 16:6 Ebram zara Serai sị, “Lee, ohu gị nwanyị dị gị nʼaka. Jiri ya mee ihe ọbụla dị gị mma nʼanya.” Nʼihi nke a, Serai mesiri ya ihe ike, nke mere ka o si nʼebe Serai nọ gbapụ.
GEN 16:7 Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị hụrụ ya nʼakụkụ isi iyi mmiri dị nʼọzara, nʼakụkụ ụzọ Shua,
GEN 16:8 jụọ ya sị, “Hega, ohu nwanyị Serai, olee ebe i si bịa, olee ebe ka ị na-ejekwa?” Hega zara sị, “Ọ bụ site nʼihu nne m ukwu Serai ka m na-agba ọsọ.”
GEN 16:9 Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara ya sị, “Laghachikwuru nne gị ukwu. Doo onwe gị nʼokpuru ya.”
GEN 16:10 Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịkwa ya, “Aga m amụba ụmụ gị, ka a hapụ inwe ike ịgụta ole ha dị.”
GEN 16:11 Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwakwara ya sị, “Ị dị ime ugbu a, ị ga-amụ nwa nwoke. Aha ị ga-agụ ya bụ Ishmel nʼihi na Onyenwe anyị anụla maka nhụju anya gị.
GEN 16:12 Nwoke dịka ịnyịnya ibu a na-azụghị azụ ka ọ ga-abụ. Ọ ga-emegide onye ọbụla, onye ọbụla ga-emegidekwa ya. Ọ ga-ebi nʼime ibu iro, megide ụmụnna ya niile.”
GEN 16:13 Hega kpọkuru aha Onyenwe anyị, onye gwara ya okwu sị, “Ị bụ Chineke m na-ahụ m.” Nʼihi na Hega kwuru sị, “Ahụla m, ugbu a, onye ahụ na-ahụ m.”
GEN 16:14 Ọ bụ ya mere e ji na-akpọ olulu mmiri ahụ, Bịa-Lahai-Rọị. Ọ ka dị ebe ahụ, nʼetiti Kadesh na Bered.
GEN 16:15 Emesịa, Hega mụtaara Ebram nwa nwoke. Ebram kpọrọ nwa nwoke ahụ Hega mụtaara ya Ishmel.
GEN 16:16 Ebram gbara iri afọ asatọ na isii mgbe Hega mụtaara ya Ishmel.
GEN 17:1 Mgbe Ebram gbara iri afọ itoolu na itoolu, Onyenwe anyị gosiri ya onwe ya sị ya, “Abụ m Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Jegharịa ije nʼihu m, bụrụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla.
GEN 17:2 Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị nʼetiti mụ na gị, mekwa ka ị mụbaa nke ukwuu nʼọnụọgụgụ.”
GEN 17:3 Ebram dara nʼala, kpudo ihu ya nʼala. Chineke gwara ya sị,
GEN 17:4 “Lee, nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị. Ị ga-abụ nna ọtụtụ mba.
GEN 17:5 Aha gị agaghị abụkwa Ebram, kama ọ ga-abụ Ebraham, nʼihi na emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.
GEN 17:6 Aga m eme gị ka ị mụbaa nke ukwuu. Aga m eme ka ị ghọọ ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-esitekwa na gị pụta.
GEN 17:7 Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị gbara guzosie ike, ka ọ dịkwara ụmụ ụmụ ndị ga-esote gị nʼọgbọ niile na-abịa. Ọ bụ ọgbụgba ndụ na-egosi na m bụ Chineke gị, na Chineke ụmụ ụmụ gị niile ga-eso gị.
GEN 17:8 Ala Kenan niile, ebe ị nọ ugbu a dịka ọbịa ka m ga-enye gị na ụmụ ụmụ gị ga-esote gị dịka ihe nketa ebighị ebi. Aga m abụ Chineke ha.”
GEN 17:9 Chineke gwara Ebraham okwu sị ya, “Ma nʼebe ị nọ, ị ghaghị irube isi imezu ihe ọgbụgba ndụ m kwuru, gị onwe gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ruo ọgbọ niile.
GEN 17:10 Nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ọgbụgba ndụ nke unu na-aghaghị idebe. A ga-ebi nwoke ọbụla nʼetiti unu ugwu.
GEN 17:11 A ga-ebi unu ugwu, bipụ elu ahụ nke anụ ahụ unu. Nke a ga-abụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na unu.
GEN 17:12 Nʼoge ọ gbara mkpụrụ ụbọchị asatọ, unu ga-ebi nwoke ọbụla nʼagbụrụ unu ugwu: ndị a mụrụ nʼụlọ, maọbụ ndị eji ego zụta site nʼaka ndị mba ọzọ, ndị na-esighị na mkpụrụ nke afọ gị.
GEN 17:13 A ga-ebi ha niile ugwu. Ma a mụrụ ha nʼezinaụlọ gị ma i ji ego zụta ha site nʼaka onye mba ọzọ. Ọgbụgba ndụ m nke ga-apụta ihe nʼanụ ahụ gị bụ ọgbụgba ndụ ebighị ebi.
GEN 17:14 Nwoke ọbụla a na-ebighị ugwu nke anụ ahụ ka a ga-ebipụ site nʼetiti ụmụnna ya. Nʼihi na o mehiela megide ọgbụgba ndụ m.”
GEN 17:15 Chineke gwakwara Ebraham sị, “Ma nʼebe Serai nwunye gị nọ, ị gaghị akpọkwa ya Serai ọzọ, kama aha ya ga-abụ Sera.
GEN 17:16 Aga m agọzi ya, sitekwa na ya nye gị nwa nwoke. Aga m agọzi ya ruo na ọ ga-abụ nne nke ọtụtụ mba. Ndị eze ga-achị ọtụtụ mmadụ ga-esite na ya pụta.”
GEN 17:17 Ebraham dara kpuo ihu nʼala, chịakwa ọchị nʼobi ya sị, “Ọ bụ onye gbara narị afọ ka a ga-amụrụ nwa? Sera, onye gbara iri afọ itoolu ọ ga-amụ nwa?”
GEN 17:18 Ebraham gwara Chineke sị, “A sịkwa na ị ga-ekwe mee ka Ishmel bụrụ onye dị ndụ nʼihu gị.”
GEN 17:19 Ma Chineke zara sị ya, “Ee, kama Sera nwunye gị ga-amụtara gị nwa nwoke. Ị ga-agụ ya Aịzik. Ọgbụgba ndụ m ga-adịkwara ya na agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
GEN 17:20 Ma banyere Ishmel, anụla m ihe i kwuru. Aga m agọzi ya mee ya ka ọ baa ụba ma dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-aghọ nna ndị eze iri na abụọ. Aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.
GEN 17:21 Ma ọgbụgba ndụ m ka m ga-eme ka o guzosie ike nʼebe Aịzik nọ, onye Sera ga-amụtara gị nʼoge dịka ugbu a nʼafọ ọzọ.”
GEN 17:22 Mgbe ọ gwasịrị Ebraham okwu, Chineke si nʼebe ọ nọ pụọ.
GEN 17:23 Nʼụbọchị ahụ, Ebraham duuru Ishmel nwa ya nwoke, na ndị ikom niile a mụrụ nʼezinaụlọ ya, tinyere ndị e ji ego zụta, ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya, bie ha ugwu dịka Chineke gwara ya ka ọ mee.
GEN 17:24 Ebraham gbara iri afọ itoolu na itoolu mgbe e biri ya ugwu,
GEN 17:25 Ishmel nwa ya gbara afọ iri na atọ.
GEN 17:26 E biri Ebraham na nwa ya bụ Ishmel ugwu nʼotu ụbọchị ahụ.
GEN 17:27 Ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ Ebraham, ndị a mụrụ nʼụlọ ya na ndị e si nʼaka ndị mba ọzọ zụta ka e biri ugwu nʼoge Ebraham biri ugwu.
GEN 18:1 Onyenwe anyị gosiri Ebraham onwe ya nʼakụkụ osisi ukwu dị na Mamre, mgbe Ebraham nọdụrụ ala nʼihu ụlọ ikwu ya, nʼetiti ehihie.
GEN 18:2 O lelitere anya ya hụ ndị ikom atọ ka ha guzo ebe ọ nọ nso. Mgbe ọ hụrụ ha, o sitere nʼihu ụlọ ikwu ya gbakwuru ha izute ha, kpọọ isiala.
GEN 18:3 Ọ sịrị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na m natara amara nʼihu gị, agabigala ohu gị.
GEN 18:4 Biko, ka ekutere unu mmiri ntakịrị, ka unu sachaa ụkwụ unu, zurukwa ike nʼokpuru osisi a.
GEN 18:5 Ka m wetara unu nri ntakịrị unu ga-eri nke ga-agba unu ume tupu unu agawa nʼihu nʼije unu ugbu a unu bịara na nke ohu unu.” Ha zara sị ya, “Ọ dị mma. Mee dịka i kwuru.”
GEN 18:6 Ya mere, Ebraham mere ngwangwa banyekwuru Sera nʼụlọ ikwu ya sị ya, “Mee ngwa, mapụta ihe ọtụtụ sịa atọ site na ọka a kwọrọ nke ọma jiri meta achịcha.”
GEN 18:7 Mgbe ahụ, Ebraham gbagara nʼigwe ehi ya, họpụta otu nwa ehi na-akaghị aka nke ahụ ya dị mma, nye ya otu ohu ya onye mere ngwangwa gbuo ya, dozie ya maka oriri.
GEN 18:8 Emesịa, Ebraham buuru mmiri ara ehi nke rahụrụ arahụ, na mmiri ara ehi, na anụ ahụ a kwadoro dozie ha nʼihu ndị ọbịa ahụ. O guzokwara nso nso ebe ha nọ nʼokpuru osisi ahụ mgbe ha na-eri nri.
GEN 18:9 Ha jụrụ ya sị, “Ebee ka Sera nwunye gị nọ?” Ọ zara sị, “Ọ nọ nʼime ụlọ ikwu.”
GEN 18:10 Ọ sịrị ya, “Nʼezie, mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a nʼafọ ọzọ, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.” Sera guzo nʼime ụlọ ikwu ahụ nke dị nʼazụ Ebraham na-ege ntị nʼihe ha na-ekwu.
GEN 18:11 Nʼoge a, Ebraham na Sera emeela nnọọ agadi, gbaakwa isi awọ. Sera agafeela oge ịmụta nwa.
GEN 18:12 Ya mere, mgbe Sera nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ọ chịrị ọchị sị, “Agadi nwanyị dịka m o si aṅaa amụta nwa, ugbu a onyenwe m karala nka?”
GEN 18:13 Onyenwe anyị jụrụ Ebraham ajụjụ sị, “Gịnị mere Sera ji achị ọchị? Gịnị mere o ji kwuo sị, ‘Olee otu agadi nwanyị dịka m ga-esi mụọ nwa?’
GEN 18:14 Ọ dị ihe nyịrị Onyenwe anyị ime? Mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a kara aka, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.”
GEN 18:15 Ma ụjọ tụrụ Sera. Nʼihi ya, ọ gọrọ agọ sị, “Achịghị m ọchị.” Ma Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Sera, ị chịrị ọchị.”
GEN 18:16 Mgbe ndị ikom atọ ahụ biliri ibidokwa ije ha, ha chere ihu ịga obodo Sọdọm, Ebraham dupụkwara ha.
GEN 18:17 Mgbe ha na-aga nʼụzọ, Onyenwe anyị tulere sị, “O kwesiri ka m zochiere Ebraham ihe m chọrọ ime?
GEN 18:18 Ebraham aghaghị ịbụ mba dị ukwuu dịkwa ike. A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na ya.
GEN 18:19 Nʼihi na ahọpụtala m ya, ka ọ tụziere ụmụ ya na ụlọ ya ndị ga-esote ya ịgbaso ụzọ Onyenwe anyị site nʼime ihe dị mma na ihe ziri ezi, ka Onyenwe anyị mezuoro Ebraham ihe niile o kwere ya na nkwa.”
GEN 18:20 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru sị, “Mkpu akwa m na-anụ site na Sọdọm na Gọmọra dị ukwuu, otu a kwa, mmehie ha jọbigara njọ oke.
GEN 18:21 Ugbu a, ana m aga ka m jiri anya m hụ ma ihe ha mere ọ dị njọ dịka mkpu akwa m na-anụ si dị. Ma o sighị otu ahụ dịrị, aga m amata.”
GEN 18:22 Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ nʼime ha gawara Sọdọm. Ma Ebraham nọ na-eguzo nʼihu Onyenwe anyị.
GEN 18:23 Ebraham jeruru Onyenwe anyị nso jụọ ya sị, “Uche gị ọ bụ ikpochapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume?
GEN 18:24 Ọ bụrụ na ị chọta iri ndị ezi omume ise nʼime obodo ahụ, ị ga-ekpochapụ obodo ahụ? Ị gaghị agbaghara ya nʼihi iri ndị ezi omume ise nọ nʼime ya?
GEN 18:25 Ọ bụghị ezi ihe na ị ga-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi. Nʼihi na ị gaghị emeso ndị ezi omume dịka i si mesoo ndị na-eme ajọ ihe. O kwesighị ka onye ga-ekpe ụwa niile ikpe, kpee ikpe ziri ezi?”
GEN 18:26 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara sị ya, “Ọ bụrụ na m achọta iri ndị ezi omume ise nʼobodo Sọdọm, aga m agbaghara obodo ahụ niile nʼihi ha.”
GEN 18:27 Ebraham kwukwara ọzọ sị, “Ugbu a m nwere ike kwuwapụta okwu nʼihu Onyenwe anyị, mụ onye bụ naanị aja na ntụ.
GEN 18:28 Eleghị anya ọ bụrụ na e nweta naanị iri ndị ezi omume anọ na ise, ị ga-emebi obodo ahụ?” Onyenwe anyị zara sị, “Agaghị m ebibi ya ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ anọ na ise nʼime ya.”
GEN 18:29 Ọzọkwa, ọ sịrị ya, “Ọ bụrụkwanụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ anọ?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Nʼihi iri mmadụ anọ, agaghị m ebibi ya.”
GEN 18:30 Mgbe ahụ ọ sịrị, “Biko, ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị ma m kwuo okwu. Eleghị anya, achọta naanị iri mmadụ atọ nʼebe ahụ?” Onyenwe anyị zaghachiri sị ya, “Agaghị m emebi ya, ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ atọ nʼime ya.”
GEN 18:31 O kwuru sị, “Ebe ọ bụ na m amalitela ịgwa gị, Onyenwe anyị okwu, biko kwere ka m gaa nʼihu. Ọ bụrụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ abụọ?” Onyenwe anyị zara sị, “Nʼihi iri mmadụ abụọ ahụ agaghị m emebi ya.”
GEN 18:32 Nʼikpeazụ, Ebraham kwuru sị, “Ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị. Ka m kwuo naanị otu ugboro a. Ọ bụrụkwanụ na a chọta naanị mmadụ iri nʼebe ahụ?” Onyenwe anyị zara sị, “Nʼihi mmadụ iri ahụ, agaghị m ebibi ya.”
GEN 18:33 Mgbe Onyenwe anyị gwachara Ebraham okwu, ọ hapụrụ ya gawa ebe ọ na-aga. Ebraham laghachiri azụ nʼụlọ ya.
GEN 19:1 Nʼoge anyasị, ndị mmụọ ozi abụọ ahụ bịarutere Sọdọm. Lọt nọ ala nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Mgbe ọ hụrụ ha, o biliri jekwuru ha, hulata ihu ya nʼala.
GEN 19:2 Ọ sịrị, “Ndị nwe m, batanụ nʼụlọ ohu unu. Unu nwere ike saa ụkwụ unu, nọọkwa ọnọdụ abalị. Chi bọọ, unu nwere ike ibilikwa bido ịga nʼihu nʼije unu.” Ha zara sị, “Ee, anyị ga-edina nʼama.”
GEN 19:3 Ma Lọt rịọsiri ha ike. Nʼikpeazụ ha sooro ya laa nʼụlọ ya. Ọ kwadooro ha ihe oriri, ya bụ achịcha na-ekoghị eko ka o ghere. Ha rikwara ya.
GEN 19:4 Tupu ha abanye ịrahụ ụra, ndị ikom obodo ahụ, ndị ikom Sọdọm, bịara gbaa ụlọ ahụ gburugburu, ma ụmụ okorobịa ma ndị agadi, ndị niile si nʼakụkụ obodo ahụ.
GEN 19:5 Ha kpọrọ Lọt oku sị ya, “Olee ebe ha nọ, bụ ndị ikom ahụ bịara nʼụlọ gị nʼabalị a? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha dinakọọ.”
GEN 19:6 Lọt pụkwuru ha nʼezi, mechie ụzọ ụlọ ya,
GEN 19:7 sị ha, “Bikonu, ndị enyi m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a.
GEN 19:8 Leenụ, enwere m ụmụ nke aka m, ụmụ agbọghọ abụọ na-amaghị nwoke. Ka m kpọpụtara unu ha, ka unu mee ha ihe masịrị unu. Ma hapụnụ ndị ikom ndị a, nʼihi na ha bụ ndị batara izere ndụ nʼụlọ m.”
GEN 19:9 Ha zara sị ya, “Pụọra anyị nʼụzọ. Mbịarambịa ka ị bụ! Leenụ mbịarambịa a! Ọ chọrọ ịbụ onye ikpe. Anyị mee gị ihe, ọ ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe anyị ga-eme ha.” Ha nuru Lọt aka nughachi ya azụ, malite itiwa ọnụ ụzọ ụlọ ya.
GEN 19:10 Ma ndị ikom ahụ nọ nʼụlọ Lọt, setịpụrụ aka ha dọbata ya nʼụlọ, ma mechie ụzọ ahụ.
GEN 19:11 Ha tiri ndị ikom ndị ahụ nọ nʼọnụ ụzọ ihe otiti nke mere ka ha kpụọ ìsì, onye ukwu ha na onye nta ha. Nʼihi ya, ha enweghị ike ịchọta ọnụ ụzọ ụlọ ahụ.
GEN 19:12 Ndị ikom abụọ ahụ gwara Lọt sị, “O nwere onye ọbụla ọzọ i nwere nʼebe a? Ndị ọgọ nwoke, maọbụ ụmụ gị ndị ikom, maọbụ ụmụ gị ndị inyom, na ọ bụ onye ọbụla bụ nke gị nʼobodo a. Site nʼebe a kpọpụ ha!
GEN 19:13 Nʼihi na anyị na-aga imebi obodo a, mkpu akwa ruru Onyenwe anyị ntị megide ndị bi nʼobodo a adịla ukwuu, nke mere o ji zite anyị ibibi ya.”
GEN 19:14 Ya mere, Lọt pụrụ gaa gwa ndị ọgọ ya nwoke, ndị na-akwado ịlụ ụmụ ya ndị inyom, sị ha, “Ọsọ, sinụ nʼobodo a pụọ. Nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ibibi ya.” Ma ndị ọgọ ya nwoke ndị a chere na ọ na-egwu egwu.
GEN 19:15 Nʼụtụtụ, mgbe chi na-abọta, ndị mmụọ ozi a kwagidere Lọt sị ya, “Ọsọ, kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a site nʼebe a gbapụ, ma ọ bụghị ya, a ga-ekpochapụ unu nʼihi ajọ omume ndị obodo a.”
GEN 19:16 Mgbe Lọt ka nọ na-eche ihe ọ ga-eme, ndị ikom ahụ jidere ya nʼaka, jidekwa nwunye ya, na ụmụ ya ndị inyom abụọ duru ha pụọ nʼobodo ahụ, nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼebe ha nọ.
GEN 19:17 Mgbe ha si nʼime obodo kpọpụta ha, otu onye nʼime ha gwara ha sị, “Gbalaganụ nʼihi ndụ unu. Unu elekwala anya nʼazụ. Unu akwụsịkwala ebe ọbụla na mbara ala. Gbaganụ nʼugwu, nʼihi na ọ bụrụ na unu emeghị otu a, a ga-ekpochapụ unu.”
GEN 19:18 Ma Lọt sịrị ha, “Mba, ndị nwe m, bikonu,
GEN 19:19 ohu unu achọtala amara nʼihu unu, unu egosila m obi ebere dị ukwuu site nʼichebe ndụ m. Ma agaghị m enwe ike gbalaga nʼugwu ka mbibi a ghara ịdakwasị m, m nwụọ.
GEN 19:20 Lee obodo dị nso nke m nwere ike ịgbaga. Ọ bụ obodo dị nta. Kwere ka m gbaga nʼebe ahụ. Obodo nta ka ọ bụ, ọ bụghị ya? Aga m echebekwa ndụ m na ya.”
GEN 19:21 Ọ zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m emere gị dịka arịrịọ gị si dị. Agaghị m emebi obodo nta ahụ.
GEN 19:22 Ma mee ngwangwa, nʼihi na o nweghị ihe ọbụla m ga-eme tutu ruo mgbe i ruru nʼebe ahụ.” (Ọ bụ nke a mere e ji akpọ aha obodo ahụ Zoa.)
GEN 19:23 Mgbe Lọt rutere obodo Zoa, anwụ awalitela nʼala ahụ.
GEN 19:24 Mgbe ahụ Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe zokwasị obodo Sọdọm na Gọmọra nkume ọkụ nke Onyenwe anyị mere ka o si nʼeluigwe zoo.
GEN 19:25 Otu a ka o si kwatuo obodo ndị ahụ niile dị na mbara ala ahụ niile, na ndị niile bi nʼobodo ndị ahụ. O kwatukwara ihe niile na-epu nʼala.
GEN 19:26 Ma mgbe nwunye Lọt lere anya nʼazụ, otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ ogidi nnu.
GEN 19:27 Nʼụtụtụ echi ya, Ebraham biliri jeruo ebe ahụ o guzoro nʼihu Onyenwe anyị nʼụbọchị gara aga.
GEN 19:28 Ọ lepụrụ anya nʼebe obodo Sọdọm na Gọmọra dị, na nʼebe mbara ala ndị ahụ niile dị. Ọ hụrụ anwụrụ ọkụ dị ukwuu nke si nʼala ahụ na-alali elu. Anwụrụ ọkụ a dị ka anwụrụ ọkụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-enwusi ike.
GEN 19:29 Ya mere, mgbe Chineke bibiri obodo ndị ahụ dị na mbara ala, o chetara Ebraham, kpọpụta Lọt site nʼoke mbibi ahụ e bibiri obodo ndị ahụ Lọt bi nʼime ha.
GEN 19:30 Emesịa, Lọt na ụmụ ya ndị inyom abụọ hapụrụ obodo Zoa, nʼihi na ọ tụrụ egwu ibi nʼime Zoa. Ọ gara biri nʼime ọgba nkume ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ.
GEN 19:31 Otu ụbọchị, ada ya sịrị nke nta, “Nna anyị emeela agadi, ọ nwekwaghị nwoke ọbụla nọ nʼụwa a, onye ga-enye anyị ụmụ, dịka omenaala si dị nʼụwa niile.
GEN 19:32 Ka anyị mee ka nna anyị ṅụọ mmanya, ka anyị na ya dinakọọ, ka anyị chebe agbụrụ anyị site na nna anyị.”
GEN 19:33 Nʼabalị ahụ, ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya, nke ada banyere soro nna ya dina. Ha abụọ nwere mmekọ. Ma ọ amaghị mgbe ada ya dinara maọbụ mgbe o bilikwara.
GEN 19:34 Nʼechi ya, ada gwara nwanne ya nke nta, “Mụ na nna anyị dinara nʼabalị gara aga. Ka anyị mee ka ọ ṅụọkwa mmanya nʼabalị taa, ka ị gaakwa ka gị na ya dina. Ka anyị mee ka agbụrụ anyị dịgide site na nna anyị.”
GEN 19:35 Ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya nʼabalị ahụ, ada ya nke nta banyere ya na nna ya dinaa. Dịka ọ dịkwa na mbụ, nna ha amataghị mgbe o dinara ala maọbụ mgbe o bilitere.
GEN 19:36 Ya mere, ụmụ ndị inyom Lọt abụọ ndị a tụrụ ime site nʼaka nna ha.
GEN 19:37 Nke ada mụtara nwa nwoke onye ọ gụrụ Moab. Ọ bụ ya bụ nna nna ndị Moab ruo taa.
GEN 19:38 Nwa ya nke nta mụtakwara nwa nwoke onye ọ gụrụ Ben-Ammi. Ọ bụ ya bụ nna nna ndị Amọn ruo taa.
GEN 20:1 Ugbu a, Ebraham sitere nʼebe ahụ bilie gaa na mpaghara Negev biri nʼebe dị nʼagbata Kadesh na Shua. Ọ nọrọ nʼobodo Gera nwa oge nta.
GEN 20:2 Nʼebe ahụ, Ebraham kwuru maka Sera, nwunye ya, sị “Ọ bụ nwanne m nwanyị.” Abimelek, eze Gera, ziri ozi kpọrọ Sera.
GEN 20:3 Ma Chineke bịakwutere Abimelek na nrọ nʼanyasị, sị ya, “Onye nwụrụ anwụ ka ị bụ, nʼihi nwanyị nke ị kpọọrọ, nwanyị a bụ onye nwere di.”
GEN 20:4 Ma Abimelek abịabeghị Sera nso, ya mere o ji sị, “Onyenwe m, ị ga-ebibi mba aka ya dị ọcha?
GEN 20:5 Ọ bụ na ya onwe ya agwaghị m sị, ‘ọ bụ nwanne m nwanyị,’ nke nwanyị nʼonwe ya, ekwuokwa sị, ‘Nwanne m nwoke ka ọ bụ?’ E ji m uche dị ọcha na aka dị ọcha mee ihe niile m mere.”
GEN 20:6 Chineke zara ya sị, “Amaara m na i ji uche dị ọcha mee ihe i mere. Ọ bụ ya mere m ji gbochie gị imehie megide m. Ọ bụkwa ya mere m ji gbochie gị ịmetụ ya aka.
GEN 20:7 Ugbu a, nyeghachi nwoke a nwunye ya. Nʼihi na ọ bụ onye amụma. Ọ ga-ekpere gị ekpere, ka ị ghara ịnwụ. Ma ọ bụrụ na i dughachịghị nwanyị a nye di ya, unu ga-anwụ, gị na ndị gị niile.”
GEN 20:8 Ya mere, Abimelek biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kpọọ nzukọ nke ndịisi ozi ya niile, kọọrọ ha ihe mere. Ha tụrụ ụjọ nke ukwuu.
GEN 20:9 Emesịa, Abimelek kpọbatara Ebraham sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Gịnị bụ ihe ọjọọ m mere i ji butere mụ na alaeze m ihe oke ikpe ọmụma dị otu a? Ihe a i mere m bụ ihe na-ekwesighị ekwesi.”
GEN 20:10 Abimelek jụrụ Ebraham sị, “Ọ bụ gịnị ka ị hụrụ i jiri mee omume dị otu a?”
GEN 20:11 Ebraham zara ya, “Nʼihi na asịrị m nʼobi m, ‘Nʼezie, ịtụ egwu Chineke adịghị nʼebe a. Ha ga-egbu m nʼihi nwunye m.’
GEN 20:12 Ewezugakwa nke a, ọ bụ nwanna m nwanyị, nʼihi na otu nna mụrụ anyị, ma ọ bụghị otu nne, tupu ọ bụrụ nwunye m.
GEN 20:13 Mgbe Chineke sitere nʼezinaụlọ nna m zipụ m ije ebe dị anya, agwara m ya sị, ‘Otu a ka ị ga-esi gosi na ị hụrụ m nʼanya, ebe ọbụla anyị gara, kwuo gbasara m, “Onye a bụ nwanne m.” ’ ”
GEN 20:14 Mgbe ahụ, Abimelek dupụtara atụrụ, na ehi, na ndị ohu ndị ikom, na ndị ohu ndị inyom, nye Ebraham. Ọ kpọnyekwara ya Sera nwunye ya.
GEN 20:15 Abimelek sịrị, “Lee nʼala m niile, birikwa nʼebe ọbụla masịrị gị.”
GEN 20:16 Mgbe ahụ, ọ sịrị Sera, “Ana m enye nwanne gị puku shekel ọlaọcha, ka ọ bụrụ ihe m ji kwụọ ụgwọ mmeso ọjọọ m mesoro gị. Ejikwa m ya na-egosi na ị bụ onye aka ya dị ọcha.”
GEN 20:17 Mgbe ahụ, Ebraham kpọkuru Chineke nʼekpere. Chineke gwọrọ Abimelek na nwunye ya, na ndị inyom ndị ohu ya niile, ka ha nwee ike ịmụta ụmụ ọzọ.
GEN 20:18 Nʼihi na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ndị inyom niile nọ nʼezinaụlọ Abimelek nʼihi Sera nwunye Ebraham.
GEN 21:1 Onyenwe anyị jiri amara leta Sera dịka o kwuru na ọ ga-eme. Onyenwe anyị meere Sera ihe o kwere na nkwa.
GEN 21:2 Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa.
GEN 21:3 Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ Sera mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik.
GEN 21:4 Mgbe Aịzik nọrọ ụbọchị asatọ site nʼụbọchị a mụrụ ya, Ebraham biri ya ugwu dịka Chineke si nye ya nʼiwu.
GEN 21:5 Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke.
GEN 21:6 Nʼoge ahụ, Sera kwuru sị, “Chineke ewetarala m ọchị. Ndị niile nụrụ akụkọ a ga-esoro m chịa ọchị.”
GEN 21:7 O kwukwara sị, “Onye gaara agwa Ebraham sị ya na Sera ga-azụlite ụmụntakịrị. Ma otu ọ dị, amụtarala m ya nwa nwoke ugbu a o merela agadi.”
GEN 21:8 Nwata ahụ tokwara, ruo mgbe a kwụsịrị ya ara. Nʼụbọchị ahụ a kwụsịrị ya ara, Ebraham kpọrọ oriri.
GEN 21:9 Ma mgbe Sera hụrụ na nwa nwoke ahụ Hega onye Ijipt mụtaara Ebraham nọ na-akwa emo,
GEN 21:10 ọ gwara Ebraham okwu sị ya, “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya. Nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị agaghị eso nwa m nwoke Aịzik keta oke nʼihe nketa.”
GEN 21:11 Okwu a wutere Ebraham nke ukwuu nʼihi na ihe banyere nwa ya nwoke Ishmel na-emetụ ya nʼobi.
GEN 21:12 Ma Chineke gwara Ebraham sị, “Ekwela ka obi jọọ gị njọ nʼihi nwantakịrị a na ohu gị nwanyị. Gee ntị nʼihe ọbụla Sera gwara gị. Nʼihi na ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.
GEN 21:13 Aga m eme ka nwa gị nwoke nke ohu gị mụtara ghọọ mba dị ukwuu, nʼihi na mkpụrụ afọ gị ka ọ bụ.”
GEN 21:14 Ebraham biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kwadoo ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ nke dị nʼime karama akpụkpọ, bunye ha Hega. O bukwasịrị ha nʼubu Hega, zipụ ya na nwa ya nwoke. Hega si nʼebe ahụ pụọ wagharịa nʼime ọzara Bịasheba.
GEN 21:15 Mgbe mmiri dị na karama akpụkpọ ahụ gwụsịrị, o nibere nwantakịrị ahụ nʼokpuru otu osisi ọhịa.
GEN 21:16 Hapụ ya gaa nọdụ ala nʼebe dịtụ anya, ihe dịka narị nzọ ụkwụ, nʼihi na o kwuru nʼobi ya sị, “Achọghị m ịhụ nwantakịrị nwoke a anya mgbe ọ na-anwụ.” Mgbe ọ nọdụrụ ebe ahụ, o bidoro ịkwa akwa.
GEN 21:17 Ma Chineke nụrụ ịkwa akwa nwantakịrị nwoke ahụ. Mmụọ ozi Chineke sikwa na mbara eluigwe kpọọ Hega oku sị ya, “Hega, gịnị na-eme gị? Atụla egwu, nʼihi na Chineke anụla olu akwa nwantakịrị ahụ nʼebe ahụ o dina.
GEN 21:18 Gaa kulite nwantakịrị ahụ kasịe ya obi, nʼihi na aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.”
GEN 21:19 Mgbe ahụ, Chineke meghere anya ya, mee ka ọ hụ olulu mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ gara kujuo karama akpụkpọ ahụ mmiri, ma nye nwantakịrị ahụ mmiri ka ọ ṅụọ.
GEN 21:20 Chineke nọnyeere nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-eto. O biri nʼọzara ahụ ghọọ onye na-agba àkụ nke ọma.
GEN 21:21 Mgbe o bi nʼọzara Paran, nne ya chọtaara ya nwunye site nʼIjipt.
GEN 21:22 Nʼoge a, Abimelek na Fikọl onyeisi ndị agha ya, bịakwutere Ebraham sị ya, “Chineke nọnyeere gị nʼihe niile ị na-eme.
GEN 21:23 Ugbu a, ṅụọra m iyi nʼaha Chineke na ị gaghị aghọgbu m maọbụ ghọgbuo ụmụ m, maọbụ ụmụ ụmụ m. Gosi m nʼobodo a i bi nʼime ya dịka onye ọbịa ụdị obiọma m gosiri gị.”
GEN 21:24 Ebraham zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m aṅụrụ gị iyi.”
GEN 21:25 Mgbe ahụ, Ebraham kọsaara Abimelek ihe banyere olulu mmiri nke ndị na-ejere ya ozi ji anya ike nara ndị na-ejere Ebraham ozi.
GEN 21:26 Abimelek zara sị, “Amaghị m onye mere ihe dị otu a. Ị gwaghị m na ihe dị otu a mere, anụghị m ya ma ọ bụghị naanị taa.”
GEN 21:27 Mgbe ahụ, Ebraham kpụpụtara atụrụ, na ehi, nye Abimelek. Ha abụọ gbara ndụ nkwekọrịta.
GEN 21:28 Mgbe Ebraham sitere nʼigwe atụrụ ya wepụta nne atụrụ asaa nupu ha ka ha nọpụ iche,
GEN 21:29 Abimelek jụrụ Ebraham sị ya, “Gịnị ka i ji nne atụrụ asaa ndị a ị họpụtara iche eme?”
GEN 21:30 Ebraham zara sị, “Nabata ụmụ atụrụ asaa ndị a dịka ihe akaebe na-egosi na ọ bụ m gwuru olulu mmiri a.”
GEN 21:31 Ya mere, e bidoro ịkpọ ebe ahụ Bịasheba, nʼihi na nʼebe ahụ ka mmadụ abụọ a nọ ṅụrịtaara onwe ha iyi.
GEN 21:32 Mgbe ha gbachara ndụ nkwekọrịta na Bịasheba, Abimelek na Fikọl onyeisi agha ya laghachiri azụ nʼala ndị Filistia.
GEN 21:33 Ebraham kụrụ osisi tamarisk na Bịasheba. Ebe ahụ ka ọ nọ kpọkuo aha Onyenwe anyị, Chineke ebighị ebi.
GEN 21:34 Ebraham bigidere nʼala ndị Filistia ogologo oge.
GEN 22:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke nwara Ebraham. Ọ sịrị ya, “Ebraham.” Ebraham zara sị, “Lekwa m.”
GEN 22:2 Chineke sịrị, “Duru nwa gị nwoke, naanị otu nwa gị nwoke, Aịzik onye ị hụrụ nʼanya, gaa nʼala Mọrịa. Jiri ya chụọrọ m aja nsure ọkụ nʼelu otu nʼime ugwu dị nʼebe m ga-egosi gị.”
GEN 22:3 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Ebraham biliri kwadoo ịnyịnya ibu ya. O duuru ndị ikom abụọ na-ejere ya ozi, na nwa ya nwoke Aịzik. O gbutere nkụ ga-ezuru ya ịchụ aja nsure ọkụ, bilie gawa ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya.
GEN 22:4 Nʼụbọchị nke atọ, Ebraham lepụrụ anya hụ ebe ahụ nʼebe dị anya.
GEN 22:5 Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị, “Nọdụnụ nʼebe a, unu na ịnyịnya ibu anyị, ka mụ na nwokorobịa a gaa nʼebe ahụ. Anyị feecha ofufe, anyị ga-alọghachikwute unu ọzọ.”
GEN 22:6 Ebraham boro nwa ya nwoke Aịzik ukwu nkụ ahụ e ji achụ aja nsure ọkụ nʼisi, ma ya onwe ya jidere ọkụ na mma.
GEN 22:7 Aịzik gwara nna ya Ebraham sị, “Nna m.” Ebraham zara, “Ehee, nwa m.” Aịzik sịrị, “Ọkụ na nkụ dị nʼebe a, olee nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ?”
GEN 22:8 Ebraham zara, “Nwa m, Chineke nʼonwe ya ga-eweta nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ.” Ha abụọ gakwara nʼihu nʼije ha.
GEN 22:9 Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ.
GEN 22:10 Mgbe ahụ Ebraham setịpụrụ aka ya, welite mma ka o gbuo nwa ya nwoke.
GEN 22:11 Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị si nʼeluigwe kpọọ ya oku sị ya, “Ebraham! Ebraham!” Ebraham zara, “Lekwa m nʼebe a.”
GEN 22:12 Ọ sịrị ya, “Emetụkwala nwokorobịa ahụ aka. Emekwala ya ihe ọbụla. Nʼihi na amatala m ugbu a na ị na-atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwa nwoke i nwere chụọrọ m aja.”
GEN 22:13 Ebraham leliri anya hụ otu ebule nke eriri ọhịa jidere na mpi ya. Ebraham gara jide ebule ahụ, were ya chụọ aja nsure ọkụ nʼọnọdụ nwa ya nwoke.
GEN 22:14 Ya mere, Ebraham kpọrọ ebe ahụ, “Onyenwe anyị ga-arọpụta.” Ya mere ruo taa a na-asị, “Nʼugwu Onyenwe anyị, a ga-arọpụta.”
GEN 22:15 Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe kpọọ Ebraham oku nke ugboro abụọ,
GEN 22:16 sị, “Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ji onwe m na-aṅụ iyi na-ekwupụta sị, ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwoke i nwere chụọrọ m aja,
GEN 22:17 aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha.
GEN 22:18 Sitekwa na mkpụrụ gị ka a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa, nʼihi na i rubeere m isi.”
GEN 22:19 Emesịa, Ebraham laghachikwuru ndị na-ejere ya ozi. Ha niile laghachikwara Bịasheba. Ebraham birikwara na Bịasheba.
GEN 22:20 Mgbe ihe ndị a gasịrị, e ziri Ebraham ozi si ya, “Lee, Milka ya onwe ya amụkwaarala nwanne gị nwoke bụ Nahọ, ụmụ ndị ikom.
GEN 22:21 Aha ha bụ Uz, onye bụ ọkpara, na Buz nwanne ya, Kemuel bụ (nna Aram),
GEN 22:22 Kesed, Hazọ, Pildash, Jidlaf na Betuel.”
GEN 22:23 Betuel mụrụ Ribeka. Milka mụtaara Nahọ, nwanne Ebraham ụmụ ndị ikom asatọ ndị a.
GEN 22:24 Iko ya nwanyị, onye aha ya bụ Reuma, mụkwaara ya ụmụ ndị ikom. Ha bụ Teba, Gaham, Tahash na Maaka.
GEN 23:1 Sera dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ abụọ na asaa.
GEN 23:2 Ọ nwụrụ na Kiriat Arba (nke bụ Hebrọn), nʼala Kenan. Ebraham ruru ụjụ nʼihi Sera, kwaa akwa nke ukwuu nʼihi ọnwụ ya.
GEN 23:3 Ebraham sitere nʼebe ozu nwunye ya dị pụọ, jekwuru ụmụ Het gwa ha sị,
GEN 23:4 “Abụ m ọbịa na onye obodo ọzọ nʼetiti unu. Resinụ m ala m ji eme ebe olili nʼebe a, ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ.”
GEN 23:5 Ụmụ Het zara Ebraham sị,
GEN 23:6 “Nna anyị ukwu, gee anyị ntị. Nwa eze dị ukwu ka ị bụ nʼetiti anyị, lie onye gị nwụrụ anwụ nʼili ahụ nke kachasị mma nʼime ili anyị nwere. O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ajụ inye gị ala olili ya maka ili onye gị nwụrụ anwụ.”
GEN 23:7 Mgbe ahụ, Ebraham biliri kpọọ isiala nʼihu ndị nwe ala, bụ ndị Het,
GEN 23:8 sị ha, “Ọ bụrụ ọchịchọ unu ka m lie onye m nwụrụ anwụ, geenụ m ntị ma rịọrọ m Efrọn nwa Zoha,
GEN 23:9 ka o resi m ọgba Makipela, nke bụ nke ya, nke dị na ngwụsị ọhịa ya. Gwa ya ka o resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru ka ọ bụrụ ebe olili m nwere nʼetiti unu.”
GEN 23:10 Efrọn onye Het nʼonwe ya so nọdụ nʼebe ahụ nʼetiti ndị ya. Ọ zara Ebraham nʼihu ndị Het niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo
GEN 23:11 sị ya, “Mba! Nna m ukwu, gee m ntị. Ana m enye gị ala ahụ na ọgba dị nʼime ya nʼihu ndị a niile bụ ndị m. Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”
GEN 23:12 Ọzọ Ebraham kpọrọ isiala nye ndị nwe ala,
GEN 23:13 ọ sịrị Efrọn, nʼihu ha niile, “Biko gee m ntị, aga m akwụ gị ọnụahịa iji zụọ ala ahụ. Nara m ya ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ nʼime ya.”
GEN 23:14 Efrọn zara Ebraham,
GEN 23:15 “Gee m ntị, nna m ukwu, ọ bụ ezie na ala ahụ ruru narị shekel ọlaọcha anọ, ma gịnị ka nke a bụ nʼetiti mụ na gị? Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”
GEN 23:16 Ebraham kwenyere nʼego ole Efrọn chọrọ ka ọ kwụọ. O ji ihe ọtụtụ tụpụtara Efrọn ego ruru ọnụahịa ọ kpọrọ aha nʼihu ndị Het niile, narị shekel ọlaọcha anọ, dịka ihe ọtụtụ nke dị nʼoge ahụ nʼetiti ndị na-azụ ahịa.
GEN 23:17 Site nʼoge ahụ, ala ahụ Efrọn nwere na Makipela, nke dị nso na Mamre, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu,
GEN 23:18 ghọrọ nke Ebraham dịka ihe nzụta ya nʼihu ụmụ Het, nʼihu ndị niile ndị bịara nʼọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ.
GEN 23:19 Emesịa, Ebraham liri Sera nwunye ya nʼime ọgba ahụ dị nʼala dị na Makipela na nso Mamre (nke dị na Hebrọn) nʼala ndị Kenan.
GEN 23:20 Ya mere, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya ka ndị Het resiri Ebraham ka ọ bụrụ nke ya, ebe a na-eli ozu.
GEN 24:1 Ugbu a, Ebraham aghọọla agadi nʼahụ ya ma nʼọnụọgụgụ afọ ya. Onyenwe anyị agọziela ya nʼụzọ niile
GEN 24:2 Ọ gwara onyeisi ndị ozi nʼụlọ ya, onye nke na-elekọta ihe niile o nwere sị ya, “Tinye aka gị nʼokpuru apata m.
GEN 24:3 Achọrọ m ka i jiri aha Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe na ụwa, ṅụọra m iyi, na ị gaghị achọtara nwa m nwoke nwunye site nʼetiti ndị Kenan, ndị m bi nʼetiti ha.
GEN 24:4 Kama na ị ga-aga nʼala nke m na ụmụnna m lụtara nwa m, bụ Aịzik, nwunye nʼetiti ụmụnna m.”
GEN 24:5 Ohu ahụ jụrụ ya, “Ọ bụrụkwanụ na nwaagbọghọ ahụ achọghị isoro m lọghachi nʼebe a, m ga-akpọrọ nwa gị nwoke laghachi nʼobodo i si bịa?”
GEN 24:6 Ebraham sịrị ya, “Lezie anya hụ na ị kpọghachighị nwa m nwoke nʼebe ahụ.
GEN 24:7 Onyenwe anyị, Chineke nke eluigwe, bụ onye kpọpụtara m site nʼụlọ nna m nakwa obodo nke aka m, onye ahụ gwara m okwu ma kwem nkwa site nʼịṅụ iyi nye sị, ‘Aga m enye ụmụ ụmụ gị ala a.’ Ọ ga-ezipụ mmụọ ozi ya ka ọ gaa nʼihu gị ka i nwee ike inwetara nwa m nwoke nwunye site nʼebe ahụ.
GEN 24:8 Ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọghị isoro gị lọghachi, mgbe ahụ, ị ga-abụ onye nwere onwe ya pụọ nʼiyi a ị ṅụrụ. Naanị na ị gaghị eme ka nwa m nwoke laghachi nʼebe ahụ.”
GEN 24:9 Ya mere, ohu ahụ tinyere aka ya nʼokpuru apata nna ya ukwu Ebraham, ṅụọ iyi banyere okwu ndị a.
GEN 24:10 Emesịa, ohu a duuru ịnyịnya kamel iri nʼime ndị nna ya ukwu nwere pụọ. O sitekwara nʼaka nna ya ukwu were ihe ọma dị iche iche maka njem a, gawa Aram Naharaim, rute nʼobodo Nahọ.
GEN 24:11 O mere ka ịnyịnya kamel ndị ahụ makpuru ala nʼakụkụ olulu mmiri dị nʼazụ obodo ahụ. Ọ bụ nʼoge anyasị, oge ụmụ nwanyị ji apụta iseta mmiri nʼebe ahụ.
GEN 24:12 Mgbe ahụ, o kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, mee ka ihe gaara m nke ọma taa. Gosi nna m ukwu Ebraham obi ebere gị.
GEN 24:13 Lee, ana m eguzo nʼakụkụ isi iyi mmiri a, ụmụ nwanyị ndị obodo a na-abịa iseta mmiri.
GEN 24:14 Kwere ka o si otu a dịrị na nwaagbọghọ nke m ga-asị, ‘Biko, zie ite gị ka m ṅụrụ mmiri.’ Ọ bụrụ na onye ahụ asị m, ‘Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nke ịnyịnya kamel gị ga-aṅụ,’ ka onye ahụ bụrụ onye ị họpụtara ohu gị Aịzik. Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi mata na i gosila nna m ukwu obi ebere.”
GEN 24:15 Tupu o kpechaa ekpere a, lekwa Ribeka ada Betuel, nwa nwoke Milka, onye bụ nwunye Nahọ, nwanne Ebraham. Ọ na-apụta bukwasị ite nʼubu ya.
GEN 24:16 Ọ bụ nwaagbọghọ mara mma nke ukwuu, onye na-amatabeghị nwoke, nke nwoke ọbụla na-edinabeghị. Ọ gara nʼolulu mmiri kujuo ite ya si nʼebe ahụ na-arịgopụta.
GEN 24:17 Ohu ahụ mere ngwangwa jekwuru ya sị ya, “Biko nyetụ m mmiri si nʼite mmiri gị.”
GEN 24:18 Ọ mere ngwangwa budata ite ahụ nʼaka ya, hulata ya si ya, “Ṅụọ, onyenwe m.”
GEN 24:19 Mgbe o nyechara ya mmiri, ọ sịrị, “Aga m ekutekwa mmiri nye ịnyịnya kamel gị ndị a ruo mgbe ha ṅụjuru afọ.”
GEN 24:20 Ngwangwa, ọ wụpụrụ mmiri dị nʼite ya nʼime ihe anụ ụlọ ji aṅụ mmiri, gbara ọsọ gaa kute mmiri ọzọ na-agbanye nʼime ihe ahụ. O kugidere mmiri tutu ruo mgbe ịnyịnya kamel ndị ahụ ṅụjuchara afọ.
GEN 24:21 Mgbe ihe ndị a na-eme, ohu ahụ gbara nkịtị na-ele ya anya ịchọpụta ma Onyenwe anyị emeela ka ije ya bụrụ ihe gara nke ọma.
GEN 24:22 Mgbe ịnyịnya kamel ndị ahụ ṅụsịrị mmiri, nwoke ahụ wepụtara mgbanimi ọlaedo nke ọtụtụ ya bụ otu beka, na mgbaaka ọlaedo abụọ nke ọtụtụ ha bụ shekel iri.
GEN 24:23 Ọ jụrụ ya sị, “Nwa onye ka ị bụ? Ohere ọ dị nʼụlọ nna gị ebe mụ na ịnyịnya kamel ndị a ga-anọ nʼabalị a?”
GEN 24:24 Ọ zara sị ya, “Abụ m nwa Betuel, nwa Milka nwunye Nahọ.”
GEN 24:25 Ọ sịkwara, “Anyị nwere nri anụ ụlọ, nweekwa ebe ị ga-edina nʼabalị a.”
GEN 24:26 Nwoke ahụ hulatara ala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị.
GEN 24:27 Kwuo sị, “Ngọzị dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nna m ukwu Ebraham, onye na-esitebeghị nʼebe nna m ukwu nọ wezuga ebere ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. Ma banyere mụ onwe m, Onyenwe anyị e duola m nʼije a, kpọrọ m rute nʼụlọ ndị ikwu nna m ukwu.”
GEN 24:28 Nwaagbọghọ ahụ gbalara gaa kọọrọ ndị ezinaụlọ nne ya ihe ndị a.
GEN 24:29 Ribeka nwere otu nwanne nwoke aha ya bụ Leban. Leban gbara ọsọ gbakwuje nwoke ahụ nʼisi iyi mmiri ahụ.
GEN 24:30 Mgbe ọ hụrụ mgbanimi, na mgbaaka ndị ahụ nwanne ya nwanyị yi nʼaka ya, ma nụkwa ihe Ribeka kwuru banyere ihe nwoke ahụ gwara ya, o jekwuru nwoke ahụ, hụ ya ka ya na ịnyịnya kamel ya guzo nʼakụkụ olulu mmiri.
GEN 24:31 Ọ sịrị ya, “Bịa, gị onye Onyenwe anyị gọziri. Gịnị mere i ji guzo nʼebe a. Edozielara m gị ụlọ ebe ị ga-edina na ebe ịnyịnya kamel ndị a ga-anọ.”
GEN 24:32 Ya mere, nwoke ahụ gara nʼụlọ, ebe Leban nyere aka butukwaara ya ibu nke ịnyịnya kamel ndị ahụ bu. E wetara nri nye ịnyịnya kamel ndị ahụ, wetara ya mmiri nke ya na ndị ikom so ya ji saa ụkwụ ha.
GEN 24:33 E doziri ya ihe oriri, ma ọ zara sị, “Agaghị m eri ihe ọbụla tutu ruo mgbe m kwuru ihe m ji bịa.” Leban sịrị, “Ngwa, kwuonụ.”
GEN 24:34 Ya mere, ọ sịrị, “Abụ m ohu Ebraham.
GEN 24:35 Onyenwe anyị agọziela nna m ukwu, mee ya ka ọ bụrụ ọgaranya. O nyela ya igwe atụrụ, na igwe ehi, na ọlaọcha na ọlaedo, na ọtụtụ ndị ohu nwoke na nwanyị, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya ibu.
GEN 24:36 Sera nwunye nna m ukwu mụtaara ya otu nwa nwoke mgbe o merela agadi. Ihe niile nna m ukwu nwere ka o nyefere nwa ahụ nʼaka.
GEN 24:37 Nna m ukwu mere ka m ṅụọra ya iyi sị, ‘Ị gaghị esite nʼetiti ụmụ ndị inyom Kenan ndị anyị bi nʼala ha lụtara nwa m nwoke nwunye.
GEN 24:38 Kama ị ga-aga nʼezinaụlọ nna m, na nke ndị ikwu m chọtara nwa m nwoke nwunye.’
GEN 24:39 “Mgbe ahụ, ajụrụ m nna m ukwu, ‘Ọ bụrụkwanụ na nwanyị ahụ ekweghị iso m lọghachi?’
GEN 24:40 “Ọ sịrị, ‘Onyenwe anyị, onye m na-ejegharị nʼihu ya, ga-eziga mmụọ ozi ya ka o soro gị gaa ime ka ije gị nwee isi, ka i nwee ike chọtara nwa m nwoke nwanyị site nʼetiti ndị ikwu m na ezinaụlọ nna m.
GEN 24:41 Ị ga-abụ onye nwere onwe gị site nʼiyi ị ṅụrụ ma ọ bụrụ na mgbe i gakwuru ndị ikwu m, ha jụrụ ịkpọnye gị nwanyị ahụ. Ị ga-abụ onye nwere onwe gị site nʼiyi ị ṅụrụ m.’
GEN 24:42 “Mgbe m rutere nʼisi iyi mmiri taa, ekwuru m sị, ‘Onyenwe anyị Chineke nna m ukwu Ebraham, ọ bụrụ na ọ masị gị, biko mee ka ije a m bịara bụrụ nke ga-aga nke ọma.
GEN 24:43 Lee, ka m na-eguzo nʼakụkụ isi iyi mmiri a, ka nwaagbọghọ ahụ bịara ikuru mmiri nke m ga-asị, “Biko kwere ka m si nʼite gị ṅụrụtụ ntakịrị mmiri,”
GEN 24:44 ma ọ bụrụ na ọ sị m, “Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nye ịnyịnya kamel gị ndị a,” ka onye dị otu a bụrụ nwanyị ahụ Onyenwe anyị chọtaara Aịzik nwa nna m ukwu.’
GEN 24:45 “Tupu m kpesịa ekpere a nʼobi m, lekwa Ribeka ka o bụ ite mmiri ya nʼubu ya na-abịa. Ọ gbadara nʼisi iyi mmiri ahụ kute mmiri. Asịrị m ya, ‘Biko nye m mmiri ka m ṅụọ.’
GEN 24:46 “Ngwangwa, o sitere nʼubu ya budata ite, sị m, ‘Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nke ịnyịnya kamel ndị a ga-aṅụ.’ Ya mere, aṅụrụ m, o nyekwara ịnyịnya kamel m ndị ahụ mmiri ha ṅụrụ.
GEN 24:47 “Mgbe ahụ, ajụrụ m ya, ‘Nwa onye ka ị bụ?’ “Ọ sịrị m, ‘Abụ m nwa Betuel onye bụ nwa Nahọ nke Milka mụtaara ya.’ “Mgbe ahụ etinyere m ya mgbanimi ahụ nʼimi ya, tinyekwa ọlaaka ahụ nʼaka ya abụọ.
GEN 24:48 Ehulatara m ala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị. Etoro m Onyenwe anyị, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, onye duru m nʼezi ụzọ inweta nwa nwanne nna m ukwu dịka nwunye nwa ya nwoke.
GEN 24:49 Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-egosi nna m ukwu obiọma na ikwesi ntụkwasị obi gwanụ m. Ọ bụrụkwanụ na ọ gaghị esi otu a dịrị, gwanụ m ka m mata ụzọ m ga-agbaso.”
GEN 24:50 Leban na Betuel zara sị ya, “Ihe niile si nʼaka Onyenwe anyị. Anyị enweghị ike ịgwa gị okwu ọjọọ maọbụ nke ọma.
GEN 24:51 Lee Ribeka, kpọrọ ya laa, ka ọ bụrụ nwunye nwa nna gị ukwu, dịka Onyenwe anyị kwuru.”
GEN 24:52 Mgbe ohu Ebraham nụrụ ihe ha kwuru, ọ dara nʼala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị.
GEN 24:53 Mgbe ahụ kwa, ohu ahụ wepụtara ihe ịchọ mma ọlaedo, na ọlaọcha dị iche iche na uwe nye ha Ribeka. Ọ wepụtakwara onyinye ndị ọzọ dị oke ọnụahịa nye nwanne ya nwoke na nne ya.
GEN 24:54 Emesịa, mgbe ihe ndị a gasịrị, ya na ndị ikom so ya riri, ṅụọ, dinaakwa nʼabalị ahụ. Mgbe ha si nʼụra teta, o kwuru sị, “Zilaga m ka m lakwuru nna m ukwu.”
GEN 24:55 Ma Leban na nne ya zara sị ya, “Ka nwantakịrị nwanyị a nọnyere anyị ihe dịka ụbọchị iri tupu o soro gị laa.”
GEN 24:56 Ma ọ zara ha sị, “Unu egbochila anyị. Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị emeela ka ije m bụrụ ihe gara nke ọma, zilaga m ka m laghachikwuru nna m ukwu.”
GEN 24:57 Ha zara sị ya, “Ka anyị kpọọ nwantakịrị nwanyị ahụ jụọ ya ihe bụ uche ya.”
GEN 24:58 Ya mere ha kpọrọ Ribeka jụọ ya sị, “Ị ga-eso nwoke a gaa?” Ọ zara sị, “E, aga m aga.”
GEN 24:59 Ya mere, ha zipụrụ nwanne ha nwanyị Ribeka, tinyere nwanyị lekọtara ya anya mgbe ọ dị na nwantakịrị, na ohu Ebraham na ndị ikom so ya.
GEN 24:60 Ha gọziri Ribeka sị ya, “Nwanne anyị nwanyị mụọ ọmụmụ, mụruo puku kwụrụ puku, ka mkpụrụ afọ gị nwetara onwe ha, ọnụ ụzọ ama ndị iro ha.”
GEN 24:61 Ribeka biliri, ya na ndị inyom na-ejere ya ozi, ha rigoro nʼelu ịnyịnya kamel ndị ahụ, soro nwoke ahụ. Ya mere, ohu ahụ duuru Ribeka laa.
GEN 24:62 Nʼoge a, Aịzik bịara nʼebe mbata obodo Bịa-Lahai-Rọị nʼihi na o bi na Negev.
GEN 24:63 Aịzik pụtara ịtụgharị uche nʼọhịa nʼoge uhuruchi. Ọ lepụrụ anya hụ ọtụtụ ịnyịnya kamel na-abịanụ.
GEN 24:64 Ribeka nʼonwe ya lepụkwara anya hụ Aịzik. O sitere nʼelu ịnyịnya kamel rịdata,
GEN 24:65 jụọ ohu ahụ sị, “Onye bụ nwoke a si nʼọhịa na-abịa izute anyị?” Ohu ahụ zara sị ya, “Ọ bụ nna m ukwu” Nʼihi nke a, Ribeka weere akwa mkpudo ya kpuchie ihu ya.
GEN 24:66 Ohu ahụ kọọrọ Aịzik akụkọ otu ije ya niile si gaa.
GEN 24:67 Aịzik kpọbatara Ribeka nʼụlọ ikwu Sera, nne ya. Ọ lụrụ Ribeka, onye ghọrọ nwunye ya. Aịzik hụrụ ya nʼanya, ma nweta nkasiobi nʼihi ọnwụ nne ya.
GEN 25:1 Ebraham lụrụ nwunye ọzọ, onye aha ya bụ Ketura.
GEN 25:2 Ọ mụụrụ ya Zimran, Jokshan, Medan, Midian, Ishbak na Shua.
GEN 25:3 Jokshan bụ nna Sheba na Dedan. Ụmụ ndị ikom Dedan bụ Ashurim, Letushim, na Leumim.
GEN 25:4 Ụmụ ndị ikom Midian bụ Efaa, Efe, Hanok, Abida, na Eldaa. Ndị a niile bụ ụmụ Ketura.
GEN 25:5 Ebraham nyere Aịzik ihe niile o nwere.
GEN 25:6 Ebraham nyere ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara onyinye dị iche iche, zipụ ha nʼala dị nʼebe ọwụwa anyanwụ, mgbe ọ ka nọ ndụ, ka ha ghara ịnọ nwa ya nwoke Aịzik nso.
GEN 25:7 Ebraham dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ asaa na ise.
GEN 25:8 Ebraham kubiri ume ndụ nwụọ mgbe o mere nnọọ ezigbo agadi, agadi nwoke nke ndụ juru afọ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya.
GEN 25:9 Ụmụ ya, Aịzik na Ishmel, liri ya nʼọgba Makipela nʼakụkụ Mamre, nʼala ubi Efrọn nwa Zoha onye Het,
GEN 25:10 ala ahụ Ebraham zụrụ site nʼaka ndị Het. Ebe ahụ ka e liri Ebraham ya na Sera nwunye ya.
GEN 25:11 Mgbe Ebraham nwụrụ, Chineke gọziri nwa ya nwoke Aịzik onye bi nʼoge ahụ na nso nso Bịa-Lahai-Rọị.
GEN 25:12 Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Ishmel nwa Ebraham onye Hega, nwanyị Ijipt ahụ na-ejere Sera ozi mụụrụ ya.
GEN 25:13 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ishmel nʼusoro ọmụmụ ha. Nebaiot bụ nwa mbụ ya. Ndị ọzọ bụ Keda, Adbel, Mibsam,
GEN 25:14 Mishma, Duma, Masa,
GEN 25:15 Hadad, Tema, Jetua, Nafish na Kedema.
GEN 25:16 Ndị a bụ ụmụ Ishmel, ndị a bụkwa aha ndịisi ikwu iri na abụọ ha, dịka ebe obibi ha si dị, na dịka ọmụma ụlọ ikwu ha si dị.
GEN 25:17 Ishmel biri ndụ ruo narị afọ na iri afọ na asaa. Ọ nwụrụ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya.
GEN 25:18 Ụmụ ụmụ ya bi nʼala dị site na Havila ruo Shua nso nso oke ala ndị Ijipt, nʼụzọ e si aga Ashọ. Ha na ụmụnna ha ndị ọzọ ebighị nʼudo.
GEN 25:19 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Aịzik nwa Ebraham. Ebraham bụ nna Aịzik.
GEN 25:20 Aịzik gbara iri afọ anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka, nwa Betuel, onye Aram si nʼobodo Padan Aram, nwanne Leban, onye Aram.
GEN 25:21 Aịzik kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. Onyenwe anyị zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime.
GEN 25:22 Ụmụ o bu nʼafọ bidoro na-alụ ọgụ nʼime afọ ya. Nʼihi nke a, o kwuru sị, “Gịnị mere ihe dị otu a ji eme m?” Ya mere, ọ gara jụta ase nʼaka Onyenwe anyị.
GEN 25:23 Onyenwe anyị gwara ya sị, “Mba abụọ dị gị nʼafọ, ụzọ mba abụọ dị nʼime gị ka a ga-ekewa. Otu ụzọ ga-adị ike karịa nke ọzọ, nke okenye ga-ejere nke nta ozi.”
GEN 25:24 Mgbe oge ime ya zuru, ụmụ abụọ dị nʼakpanwa ya.
GEN 25:25 Ahụ nwa nke mbụ buru ụzọ pụta na-acha uhie uhie, ahụ ya niile dịka uwe ajị. Nʼihi ya, ha kpọrọ aha ya Ịsọ.
GEN 25:26 Emesịa, nwanne ya pụtara, ma aka ya jidere ikiri ụkwụ Ịsọ. Nʼihi ya, a kpọrọ aha ya Jekọb. Aịzik gbara iri afọ isii mgbe Ribeka mụrụ ha.
GEN 25:27 Ha abụọ toro, Ịsọ ghọrọ onye ọka nʼịchụ nta, onye na-epiogharị nʼọhịa, ebe Jekọb bụ nwoke dị nwayọọ, onye na-anọ nʼetiti ụlọ ikwu.
GEN 25:28 Aịzik hụrụ Ịsọ nʼanya nʼihi na ụtọ anụ Ịsọ na-egbute nʼọhịa na-adị ya mma, ma Ribeka hụrụ Jekọb nʼanya.
GEN 25:29 Otu ụbọchị, Jekọb nọ na-esi ofe mgbe Ịsọ si nʼọhịa bata. Agụụ na-agụkwa ya nke ukwuu.
GEN 25:30 Ịsọ rịọrọ Jekọb sị, “Nyetụ m ụfọdụ nʼime nri a na-acha uhie uhie ị na-esi ka m rie, nʼihi na agụụ na-agụ m hie nne.” (Ọ bụ ihe a mere e ji na-akpọ ya Edọm.)
GEN 25:31 Ma Jekọb zara ya, “Buru ụzọ resi m ọnọdụ ịbụ ọkpara gị.”
GEN 25:32 Ịsọ sịrị, “Gịnị bụ uru ọnọdụ ịbụ ọkpara bara mgbe m na-anwụ nʼagụụ?”
GEN 25:33 Jekọb sịrị ya, “Buru ụzọ ṅụọrọ m iyi.” Ya mere, ọ ṅụụrụ ya iyi, sị otu a resi Jekọb ọnọdụ ọkpara ya.
GEN 25:34 Mgbe ahụ, Jekọb nyere Ịsọ achịcha na ofe lentil o siri. O riri, ṅụọkwa, bilie ọtọ pụọ. Ya mere Ịsọ ledara ọnọdụ ịbụ ọkpara nna ya anya.
GEN 26:1 Nʼoge a, ụnwụ dara nʼala ahụ. Ụnwụ a dị iche nʼụnwụ mbụ nke dara nʼoge Ebraham dị ndụ. Aịzik jekwuru Abimelek eze ndị Filistia nʼobodo Gera.
GEN 26:2 Onyenwe anyị gosiri Aịzik onwe ya, sị, “Agakwala Ijipt; biri nʼala ahụ m sị gị biri nʼime ya.
GEN 26:3 Nọrọ nʼala a nwa oge nta, aga m anọnyere gị ma gọziekwa gị, nʼihi na gị na ụmụ ụmụ gị ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m emezukwa iyi ahụ m ṅụrụ nye Ebraham nna gị.
GEN 26:4 Aga m eme ka ụmụ ụmụ gị mụbaa, mee ka ha hie nne nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe. Ha ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m esite na mkpụrụ gị gọzie mba niile nke ụwa.
GEN 26:5 Ihe ndị a niile ka m ga-eme nʼihi na Ebraham rubere isi ime ihe m gwara ya, na idebe iwu m na ụkpụrụ m, na ịdọ aka na ntị m.”
GEN 26:6 Ya mere, Aịzik nọgidere nʼobodo Gera.
GEN 26:7 Mgbe ndị obodo ahụ jụrụ ya banyere nwunye ya, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ nwanne m nwanyị.” Ọ tụrụ ụjọ ị sị ha, “Nwunye m ka ọ bụ,” O chere nʼobi ya sị, “Ndị ikom obodo a nwere ike gbuo m nʼihi Ribeka. Nʼihi na Ribeka nʼonwe ya mara mma ile anya.”
GEN 26:8 Mgbe Aịzik nọrọ ebe ahụ ogologo oge, Abimelek eze ndị Filistia, sitere na oghereikuku ya lepụ anya hụ Aịzik ka ọ nọ na-egwusa Ribeka nwunye ya egwu.
GEN 26:9 Ya mere, Abimelek kpọrọ Aịzik sị, “Nwunye gị ka ọ bụ nʼezie. Gịnị mere i ji gwa anyị na ọ bụ nwanne gị nwanyị?” Aịzik zara ya, “Ọ bụ nʼihi na m chere na-enwere ike igbu m nʼihi ya.”
GEN 26:10 Abimelek sịrị, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Otu nwoke nʼetiti anyị gaara akpọrọ nwunye gị dinaa ya. Ị gaara esi otu a wetara anyị ikpe ọmụma.”
GEN 26:11 Ya mere, Abimelek nyere ndị niile ya iwu, sị ha, “Onye ọbụla metụrụ nwoke a maọbụ nwunye ya aka, aghaghị ime ka ọ nwụọ.”
GEN 26:12 Aịzik kụrụ mkpụrụ ubi nʼala ahụ. Nʼotu afọ ahụ kwa, o si nʼala ahụ webata ihe ubi narị okpukpu karịa nke ọ kụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị gọziri ya.
GEN 26:13 Nwoke a bara ụba, ghọọ ọgaranya. Akụnụba ya gara nʼihu na-amụba, tutu ruo mgbe ọ ghọrọ nnọọ onye ọgaranya a ma ama.
GEN 26:14 O nwere ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, na ndị ikom na-ejere ya ozi. Nʼihi ihe ndị a, ndị Filistia bidoro inwe anya ukwu megide ya.
GEN 26:15 Ndị Filistia wụjuru aja nʼolulu mmiri ndị ahụ niile ndị na-ejere nna ya ozi gwuru nʼoge nna ya Ebraham dị ndụ.
GEN 26:16 Abimelek kpọrọ Aịzik sị ya, “Si nʼala a kwapụ gaa nʼebe ọzọ, nʼihi na ịba ụba gị na ịdị ike gị adịla ukwuu karịa nke anyị.”
GEN 26:17 Ya mere Aịzik si nʼebe ahụ kwapụ, gaa maa ụlọ ikwu ya na Ndagwurugwu Gera, biri nʼebe ahụ.
GEN 26:18 O gwugharịkwara olulu mmiri ndị ahụ e gwuru nʼoge nna ya Ebraham, nke ndị Filistia kpojuru aja mgbe Ebraham nwụrụ, kpọọ olulu mmiri ndị a otu aha ahụ nna ya kpọrọ ha na mbụ.
GEN 26:19 Ọzọ, ndị na-ejere Aịzik ozi gwuru olulu mmiri ọhụrụ na ndagwurugwu Gera ahụ, gwute mmiri nke si nʼala na-asọpụta.
GEN 26:20 Ma ndị ọzụzụ anụ ụlọ obodo Gera sesịrị ndị ọzụzụ anụ ụlọ Aịzik okwu. Ha kwuru sị, “Mmiri a bụ nke anyị!” Nke a mere Aịzik ji kpọọ olulu mmiri ahụ Esek, nʼihi ise okwu nke ha sesịrị ya.
GEN 26:21 Ha gwuru olulu mmiri ọzọ, ma ndị ahụ bịakwara ọzọ bido ịzọ ya. Nʼihi ya Aịzik kpọrọ olulu mmiri ahụ Sitna.
GEN 26:22 O si nʼebe ahụ pụọ gaa nʼebe ọzọ gwuo olulu mmiri ọzọ. Ma o nweghị ndị bịara zọọ ya. Nʼihi ya ọ kpọrọ olulu mmiri ahụ Rehobọt. O kwuru sị, “Ugbu a, Onyenwe anyị enyela anyị ebe sara mbara, ebe ihe ga-anọ gaara anyị nke ọma.”
GEN 26:23 O sitere nʼebe ahụ kwapụ gaa Bịasheba.
GEN 26:24 Nʼabalị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya anya, sị ya, “Abụ m Chineke nna gị Ebraham. Atụla egwu, nʼihi na anọnyere m gị, aga m agọzi gị, mụbaa ọnụọgụgụ ụmụ ụmụ gị nʼihi ohu m Ebraham.”
GEN 26:25 Ya mere, o wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị. Ọ makwara ụlọ ikwu ya nʼebe ahụ. Ndị na-ejere ya ozi gwukwara olulu mmiri.
GEN 26:26 Abimelek na Ahuzat, onye ndụmọdụ ya, na Fikọl onyeisi ndị agha ya sitere Gera jekwuru Aịzik.
GEN 26:27 Aịzik jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji bịakwute m, ebe ọ bụ na unu kpọrọ m asị, chụpụkwa m site nʼetiti unu?”
GEN 26:28 Ha sị, “Anyị hụrụ nke ọma na Onyenwe anyị nọnyeere gị, ya mere anyị ji sị, ‘O kwesiri ka ịṅụ iyi dị nʼetiti anyị na gị,’ ka anyị na gị gbaakwa ndụ
GEN 26:29 na ị gaghị eme anyị ihe ọjọọ dịka anyị na-esighị mee gị ihe ọjọọ. I lezie anya nke ọma, ị ga-ahụ na anyị meere gị ihe ọma mgbe anyị hapụrụ gị ka ị laa nʼudo. Ugbu a, anyị maara na ị bụ onye Onyenwe anyị gọziri agọzi.”
GEN 26:30 Aịzik meere ha mmemme nri dị ukwuu; ha riri, ṅụọkwa.
GEN 26:31 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị ikom ahụ niile ṅụrịtaara onwe ha iyi ịgba ndụ. Aịzik zilagara ha, ha hapụrụ ya laa nʼudo.
GEN 26:32 Nʼotu ụbọchị ahụ kwa, ndị ohu Aịzik bịakwutere ya gwa ya banyere olulu mmiri ha na-egwu, sị ya, “Anyị achọtala mmiri nʼolulu ahụ anyị na-egwu.”
GEN 26:33 Ọ kpọrọ ya Shiba. Ọ bụkwa nke a mere e ji akpọ obodo ahụ Bịasheba ruo taa.
GEN 26:34 Mgbe Ịsọ gbara iri afọ anọ, ọ lụrụ Judit nwa Beiri, onye Het. Ọ lụkwara Basemat nwa Elọn, onye Het.
GEN 26:35 Ha ghọrọ Aịzik na Ribeka ihe ọnọdụ obi ilu.
GEN 27:1 Mgbe Aịzik ghọrọ agadi, nʼoge anya ya na-adịghị ahụzi ụzọ nke ọma, ọ kpọrọ Ịsọ ọkpara ya, sị ya, “Nwa m nwoke.” Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.”
GEN 27:2 Aịzik gwara ya sị, “Ugbu a, emeela m agadi, amakwaghị m ụbọchị ọnwụ m.
GEN 27:3 Ya mere, were ihe ịchụ nta gị, ụta gị na àkụ gị, gaa nʼọhịa, gbutere m anụ.
GEN 27:4 Siere m nri ụtọ otu ahụ o si amasị m, butere m ya ka m rie, ka mụ onwe m gọzie gị tupu m nwụọ.”
GEN 27:5 Ma Ribeka nọ na-ege ntị mgbe Aịzik na-agwa nwa ya Ịsọ okwu. Nke mere na mgbe Ịsọ gawara nʼọhịa ịchụ nta,
GEN 27:6 Ribeka gwara Jekọb nwa ya okwu sị ya, “Lee, anụrụ m ka nna gị na-agwa nwanne gị Ịsọ okwu sị ya,
GEN 27:7 ‘Gaa nʼọhịa gbute anụ, siere m nri ụtọ, ka m nọdụ nʼihu Onyenwe anyị nye gị ngọzị ikpeazụ tupu m nwụọ.’
GEN 27:8 Ugbu a, nwa m nwoke, gee ntị nke ọma, mee ihe niile m gwara gị.
GEN 27:9 Gaa ugbu a nʼigwe anụ ụlọ wetara m ụmụ nwa ewu abụọ dị mma ka m jiri ha siere nna gị nri dị ụtọ, ụdị ahụ na-amasị ya.
GEN 27:10 Ị ga-eburu ya bujere nna gị ka o rie, ka ya onwe ya gọzie gị tupu ọ nwụọ.”
GEN 27:11 Ma Jekọb gwara Ribeka nne ya okwu sị ya, “Nwanne m nwoke Ịsọ bụ onye gbara ajị. Ahụ nke m na-akwọ mụrụmụrụ.
GEN 27:12 Gịnị ga-eme ma nna m metụ m aka nʼahụ? Nʼihi ya, aga m abụ onye na-aghọ ya aghụghọ, aga m esi otu a wetara onwe m ịbụ ọnụ kama ngọzị.”
GEN 27:13 Nne ya gwara ya sị, “Nwa m nwoke ka ọbụbụ ọnụ gị dakwasị m. Naanị mee ihe m kwuru. Gaa wetara m ha.”
GEN 27:14 Ya mere, ọ gara weta ha nye nne ya. O ji ha sie nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị nna ya.
GEN 27:15 Emesịa, Ribeka chịpụtara uwe Ịsọ ọkpara ya, ndị dị mma, ndị ọ debere nʼụlọ ya, nye ya nwa ya nta bụ Jekọb.
GEN 27:16 O jikwa akpụkpọ anụ ụmụ ewu nwere ajị ajị kee Jekọb nʼaka na nʼakụkụ olu ya na-akwọ mụrụmụrụ.
GEN 27:17 O bunyere nwa ya nwoke Jekọb nri ahụ na-atọ ụtọ, na achịcha o mere.
GEN 27:18 O jekwuuru nna ya sị ya, “Nna m.” Ọ zara sị, “Ahaa, nwa m, onye ka ị bụ?”
GEN 27:19 Jekọb zara nna ya sị ya, “Abụ m Ịsọ, ọkpara gị. Emeela m ihe ị sị m mee. Biko bilie ka i rie anụ m gbutere nʼọhịa, ka gị onwe gị gọzie m.”
GEN 27:20 Ma Aịzik jụrụ nwa ya nwoke sị, “Olee otu i si chọta ya ngwangwa, nwa m?” Jekọb zara ya sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke gị mere ka ihe gaara m nke ọma.”
GEN 27:21 Mgbe ahụ Aịzik gwara Jekọb sị, “Bịa nso ka m metụ gị aka nwa m nwoke, ka m mata ma ị bụ Ịsọ nʼeziokwu.”
GEN 27:22 Jekọb jere nna ya Aịzik nso, onye metụrụ ya aka kwuo sị, “Olu bụ olu Jekọb ma aka gị bụ aka Ịsọ.”
GEN 27:23 Ọ chọpụtaghị na ọ bụ Jekọb, nʼihi na aka ya dị ajị ajị dịka nke Ịsọ. Ya mere, ọ gọziri ya.
GEN 27:24 Ma ọ jụkwara ya ajụjụ ọzọ sị ya, “Ị bụ nwa m nwoke Ịsọ nʼeziokwu?” Jekọb zara sị ya, “E, abụ m ya.”
GEN 27:25 Mgbe ahụ, Aịzik zara sị ya, “Butere m ụfọdụ nʼime anụ ahụ i gbutere ka m rie, nye gị ngọzị m.” Jekọb butere ya bunye ya. O riri ya.
GEN 27:26 Mgbe ahụ, nna ya Aịzik sịrị ya, “Bịa nʼebe a nwa m nwoke, sutu m ọnụ.”
GEN 27:27 Ya mere, o jekwuuru ya sutu ya ọnụ. Mgbe Aịzik nụrụ isisi uwe ya, ọ gọziri ya, sị, “Nʼezie, isisi nwa m nwoke dịka isisi ala ubi nke Onyenwe anyị gọziri.
GEN 27:28 Ka Chineke nye gị site nʼigirigi nke eluigwe, na mmanụ nke ala, ụba nke mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ
GEN 27:29 Ka ọtụtụ mba jeere gị ozi, ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye gị. Bụrụ onye ọchịchị nʼebe ụmụnna gị nọ, ka ụmụ nne gị mụrụ kpọọ isiala nye gị. Ka ndị niile na-abụ gị ọnụ bụrụ ndị a bụrụ ọnụ, ka ndị na-agọzi gị bụrụ ndị a gọziri agọzi.”
GEN 27:30 Mgbe Aịzik gọzichara Jekọb, ka Jekọb si nʼihu ya na-apụ, lee Ịsọ ka o si ịchụ nta na-alọbata.
GEN 27:31 Ya onwe ya sikwara nri na-atọ ụtọ butere nna ya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ka nna m, bilie, rie anụ nwa ya si nʼọhịa gbute, ka gị onwe gị nye m ngọzị gị.”
GEN 27:32 Aịzik zara sị ya, “Ị bụ onye?” Ọ zara sị, “Abụ m nwa gị nwoke Ịsọ, ọkpara gị Ịsọ.”
GEN 27:33 Oke ahụ ọma jijiji mara Aịzik, ọ sị, “Onye kwanụ bụ onye ahụ gara gbute anụ butere m ya? Eriri m ya tupu ị bata. Agọziri m ya. Nʼezie, onye a gọziri agọzi ka ọ ga-abụ.”
GEN 27:34 Mgbe Ịsọ nụrụ okwu ndị a si nʼọnụ nna ya, o jiri oke olu kwaa akwa nke obi ilu gwa nna ya sị ya, “Gọzie m, mụ onwe m, nna m.”
GEN 27:35 Ma ọ zara sị ya, “Nwanne gị ejirila ụzọ aghụghọ bịa nara ngọzị gị.”
GEN 27:36 Ịsọ kwuru sị, “E meziri kpọọ ya Jekọb, onye aghụghọ. Lee, ọ ghọgbuola m ugboro abụọ. Nke mbụ, ọ naara m ọnọdụ ịbụ ọkpara m, ugbu a ọ narakwala m ngọzị m.” Ọ jụrụ ajụjụ sị, “Ọ bụ na i nweghị ngọzị ọ bụla fọdụrụ nke ị ga-agọzi m?”
GEN 27:37 Aịzik zara sị ya, “Emeela m ya ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ị nọ, mee ụmụnna ya niile ndị na-ejere ya ozi. Enyela m ya mkpụrụ ubi niile na mmanya ọhụrụ. Gịnị ọzọ ka m nwere ike imere gị, nwa m nwoke?”
GEN 27:38 Ịsọ jụrụ nna ya sị, “Nna m, ọ bụ naanị otu ngọzị ka i nwere? Gọziekwa m nna m!” Ịsọ kwara akwa nʼoke olu.
GEN 27:39 Nna ya Aịzik zara sị ya, “Ebe obibi gị ga-adịpụ adịpụ, site nʼebe akụnụba nke ala dị, site nʼebe igirigi nke eluigwe dị.
GEN 27:40 Nriju afọ gị ga-abụ site na mma agha, ị ga-ejekwara nwanne gị ozi. Ma mgbe i mesịrị nwere onwe gị, ị ga-atọpụ agbụ ya, site nʼolu gị.”
GEN 27:41 Ịsọ buru iro nʼobi megide Jekọb nʼihi ngọzị ahụ nna ya nyere ya. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Oge a ga-eru ụjụ nʼihi nna m na-abịa nso, nʼoge ahụ aga m egbu nwanne m Jekọb.”
GEN 27:42 Mgbe a gwara Ribeka ihe nwa ya nwoke nke okenye bụ Ịsọ kwuru, o ziri kpọọ nwa ya nwoke nke nta bụ Jekọb sị ya, “Lee, Ịsọ nwanne gị na-akasị onwe ya obi site nʼechiche ọ na-eche igbu gị.
GEN 27:43 Nʼihi nke a, nwa m nwoke, mee ihe m gwara gị, gbapụ ọsọ ngwangwa, gbakwuru nwanne m Leban na Haran,
GEN 27:44 Nọdụ nʼebe ahụ ruo mgbe iwe nwanne gị ga-adajụ.
GEN 27:45 Mgbe nwanne gị kwụsịrị iwe iwe megide gị, mgbe o chefuru ihe i mere ya, aga m ezitere gị ozi ka ị lọta. Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbara aka unu abụọ nʼotu ụbọchị.”
GEN 27:46 Mgbe ahụ Ribeka gara gwa Aịzik sị, “Ike ịdị ndụ agwụla m nʼihi ndị inyom Het ndị a. Ọ bụrụ na Jekọb esite nʼetiti ndị inyom ala a, site nʼetiti ndị inyom Het ndị a lụọ nwunye, mara na ọnwụ ga-akara m ịdị ndụ mma.”
GEN 28:1 Aịzik kpọrọ Jekọb gọzie ya, nye ya iwu sị ya, “Alụla nwunye site nʼala Kenan.
GEN 28:2 Kama bilie gaa Padan Aram nʼụlọ nna nne gị, Betuel, lụrụ nwunye site nʼụmụ ndị inyom Leban.
GEN 28:3 Ka Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gọzie gị, mee ka ị mịa mkpụrụ, mụbaa, ghọọ ọtụtụ mba.
GEN 28:4 Ka Chineke nye gị na ụmụ ụmụ gị ngọzị ahụ o kwere nkwa inye Ebraham. Ka i nweta ala a, nke i bi nʼime ya ugbu a dịka ọbịa, bụ ala ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa inye ya.”
GEN 28:5 Mgbe ahụ Aịzik zipụrụ Jekọb nʼije ya, ọ gara Padan Aram, nʼụlọ Leban nwa Betuel onye Aram, nwanne Ribeka onye bụ nne Jekọb na Ịsọ.
GEN 28:6 Ịsọ hụrụ ka Aịzik siri gọzie Jekọb, ziga ya Padan Aram ka ọ gaa lụọ nwunye nʼebe ahụ, nyekwa ya iwu mgbe ọ na-agọzi ya sị, “Alụla nwanyị na Kenan,”
GEN 28:7 Jekọb rubekwara nna ya na nne ya isi gawa Padan Aram.
GEN 28:8 O dokwara Ịsọ anya na ndị inyom Kenan dị njọ nʼanya nna ya Aịzik.
GEN 28:9 Nʼihi ya, Ịsọ gakwuru Ishmel lụrụ Mahalat, ada Ishmel, nwa Ebraham, onye bụ nwanyị Nebaiot, tinyekwara ndị nwunye ọ lụrụ na mbụ.
GEN 28:10 Jekọb hapụrụ Bịasheba gawa Haran.
GEN 28:11 Mgbe chi na-eji, ọ kwụsịrị ebe ọ ga-anọ zuo ike abalị. Mgbe ọ chọrọ idina ala, o weere otu nʼime nkume ndị dị nʼebe ahụ hinye nʼisi ya, dinara ala ịrahụ ụra.
GEN 28:12 Nʼabalị ahụ, ọ rọrọ nrọ, hụ mbube e ji arị elu. E mere ka o guzo site nʼụwa ruo nʼeluigwe. Ọ hụkwara ndị mmụọ ozi Chineke ka ha si na ya na-arịgo na-arịdakwa.
GEN 28:13 Nʼelu ya, ọ hụrụ Onyenwe anyị ka o guzo, nụkwa ka ọ na-agwa ya okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Chineke nna gị Ebraham, na Chineke Aịzik. Aga m enye gị na ụmụ ụmụ gị ala ahụ nke i dina nʼelu ya.
GEN 28:14 Ụmụ gị ga-adị ukwuu, dị ka aja dị nʼala. Ha ga-ejupụta ala a, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼugwu ruo na ndịda. A ga-esitekwa na gị na mkpụrụ gị, gọzie mba niile nke ụwa a.
GEN 28:15 Anọnyeere m gị. Aga m echebe gị ebe ọbụla ị na-aga. Aga m akpọghachite gị nʼala a. Agaghị m ahapụ gị tutu ruo mgbe m mezuoro gị ihe niile m kwere gị na nkwa.”
GEN 28:16 Jekọb tetara nʼụra sị, “Nʼezie Onyenwe anyị nọ nʼebe a. Ma amaghị m ya.”
GEN 28:17 Ọ tụrụ egwu sị, “Lee ka ebe a si dị oke egwu, o nweghị ihe ebe a bụ karịa ụlọ Chineke, nʼezie ọ bụ ọnụ ụzọ ama eluigwe.”
GEN 28:18 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Jekọb weere nkume ahụ o hinyere nʼisi ya guzo ya dịka ogidi, wụsa mmanụ nʼelu ya.
GEN 28:19 Ọ kpọrọ ebe ahụ Betel, ọ bụ ezie na Luz bụ aha obodo ahụ na mbụ.
GEN 28:20 Mgbe ahụ, Jekọb kwere nkwa sị, “Ọ bụrụ na Chineke ga-anọnyere m, chebe m nʼije m na-eje, ọ bụrụ na ọ ga-enye m ihe oriri m ga-eri na uwe m ga-eyi,
GEN 28:21 m lọghachi nʼụlọ nna m nʼudo, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-abụ Chineke m.
GEN 28:22 Nkume a m doziri elu dịka ogidi ga-abụ ụlọ Chineke. Aga m eke ihe niile i nyere m ụzọ iri, nyeghachi gị otu ụzọ.”
GEN 29:1 Jekọb gara nʼihu nʼije ya rute nʼala dị nʼọwụwa anyanwụ.
GEN 29:2 NʼEbe Nsọ a, ọ hụrụ otu olulu mmiri, hụkwa ụzọ igwe atụrụ atọ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri nʼihi na ndị na-elekọta ha na-enye ha mmiri site nʼolulu mmiri ahụ. Nkume e ji mechie ọnụ olulu mmiri ahụ buru ibu.
GEN 29:3 Nʼihi na mgbe igwe atụrụ niile bịazukọtara nʼolulu mmiri ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ na-emeghepụ nkume ahụ nye ha mmiri. Emesịa, ha na-ejikwa nkume ahụ mechie ọnụ olulu mmiri ahụ.
GEN 29:4 Jekọb jekwuru ndị na-elekọta atụrụ ahụ jụọ ha sị, “Ụmụnna m, ebee ka unu si?” Ha zara sị ya, “Anyị si Haran.”
GEN 29:5 Ọ jụrụ ha sị, “Unu maara Leban, nwa Nahọ?” Ha zara sị, “Anyị ma ya.”
GEN 29:6 Ọzọ Jekọb jụrụ ha sị, “Ahụ ọ dịkwa ya mma?” Ha zara sị ya, “E, ahụ dị ya. Lee nwa ya nwanyị Rechel ka ọ chị atụrụ ya na-abịa.”
GEN 29:7 Jekọb kwuru sị, “Lee, anyanwụ ka na-acha. O rubeghị oge e ji achịbata igwe ụmụ anụ ụlọ. Nyenụ ha mmiri ka ha ṅụọ, ka ha laghachi gaa taa ahịhịa.”
GEN 29:8 Ha zara sị ya, “Anyị agaghị enye ha mmiri tutu ruo mgbe igwe atụrụ niile bịakọtara, mgbe e wepụrụ nkume e ji mechie ọnụ olulu mmiri, mgbe ahụ ka anyị ga-enye ha mmiri.”
GEN 29:9 Mgbe Jekọb na ndị ọzụzụ atụrụ ndị a kpụ okwu nʼọnụ, Rechel chịịrị atụrụ nna ya bịakwute ha, nʼihi na onye ọzụzụ atụrụ nwanyị ka ọ bụ.
GEN 29:10 Mgbe Jekọb hụrụ Rechel nwa Leban nwanne nne ya, hụkwa igwe atụrụ Leban, ọ meghepụrụ nkume ahụ e ji mechie ọnụ olulu mmiri ahụ nye igwe atụrụ Leban, nwanne nne ya mmiri ka ha ṅụọ.
GEN 29:11 Emesịa, Jekọb suturu Rechel ọnụ, kwaa akwa nʼoke olu.
GEN 29:12 Jekọb kọwaara Rechel na ọ bụ onye ikwu nna ya, bụrụkwa nwa Ribeka. Nʼihi ya Rechel ji ọsọ gbalaa nʼụlọ ha kọọrọ nna ya.
GEN 29:13 Mgbe Leban nụrụ maka Jekọb nwa nwanne ya nwanyị, o mere ngwangwa pụọ izute ya. Ọ makụrụ ya, sutu ya ọnụ, kpọrọ ya laa nʼụlọ. Nʼebe ahụ, Jekọb kọọrọ ya ihe ndị a niile.
GEN 29:14 Leban sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ ọkpụkpụ m na anụ ahụ m.” Ọ nọnyeere ya otu ọnwa.
GEN 29:15 Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụ nʼihi na ị bụ onye ikwu m ka ị na-agbara m odibo nʼefu? Gwa m ego ole m ga-akwụ gị nʼihi ọrụ ị na-arụrụ m?”
GEN 29:16 Leban mụrụ ụmụ ndị inyom abụọ. Aha nke okenye bụ Lịa. Aha nke nta bụ Rechel.
GEN 29:17 Ịma mma Lịa dị ya nʼanya, ma Rechel mara mma nʼahụ, maakwa mma ile anya.
GEN 29:18 Ọ bụ Rechel ka Jekọb hụrụ nʼanya. Nʼihi ya Jekọb gwara Leban sị, “Aga m arụrụ gị ọrụ afọ asaa ma ọ bụrụ na ị ga-ekwe ka m lụọ Rechel.”
GEN 29:19 Leban zara Jekọb sị ya, “Ọ dị mma na ị lụrụ Rechel karịa na onye ọzọ ga-alụ ya. Soro m nọdụ nʼebe a.”
GEN 29:20 Ya mere Jekọb gbara odibo afọ asaa maka Rechel. Ma afọ asaa ndị a dịka abalị ole na ole nʼanya Jekọb nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe Rechel nọ.
GEN 29:21 Jekọb gwara Leban, okwu sị ya, “Kpọnye m nwunye m nʼihi nʼụbọchị m ezuola. Achọrọ m ịbakwuru ya.”
GEN 29:22 Leban kpọkọtara ndị niile bi nʼebe ahụ mere ha nʼoke oriri.
GEN 29:23 Nʼanyasị ụbọchị ahụ, Leban kpọọrọ nwa ya nwanyị bụ Lịa kpọbara Jekọb, ọ bakwuuru ya.
GEN 29:24 Leban nyekwara Lịa odibo ya, Zilpa, ka ọ bụrụ odibo nwanyị ya.
GEN 29:25 Mgbe chi bọrọ, Jekọb hụrụ na ọ bụ Lịa ka Leban kpọnyere ya. Jekọb sịrị Leban, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Ọ bụghị nʼihi Rechel ka m ji gbaara gị odibo? Gịnị mere i ji ghọgbuo m?”
GEN 29:26 Leban zara sị ya, “Ọ bụghị omenaala anyị ibu ụzọ kee nwantakịrị nwanyị nke nta di tupu nke ada.
GEN 29:27 Otu ọ dị, chere ka mmemme izu ụka nke onye nke a gafee. Mgbe ahụ, aga m akpọnyekwa gị onye nke ọzọ a maka odibo ị ga-agbara m afọ asaa ọzọ.”
GEN 29:28 Jekọb mere ka o si kwuo. O debezuru mmemme otu izu ụka onye nke a, Leban kpọnyere ya nwa ya Rechel ka ọ bụrụ nwunye ya.
GEN 29:29 Leban nyere nwa ya nwanyị, Rechel, odibo ya nwanyị bụ Bilha, ka ọ bụrụ odibo ya.
GEN 29:30 Jekọb bakwukwara Rechel. Ọ hụrụ Rechel nʼanya nke ukwuu karịa Lịa. Ọ gbakwaara Leban odibo afọ asaa ọzọ.
GEN 29:31 Mgbe Onyenwe anyị hụrụ na Lịa bụ nwanyị a kpọrọ asị, o meghere akpanwa ya, ma Rechel bụ nwanyị aga.
GEN 29:32 Lịa tụrụ ime mụọ nwa nwoke, kpọọ ya Ruben. Nʼihi na o kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị ahụla nsogbu m, ugbu a di m ga-ahụ m nʼanya.”
GEN 29:33 Ọ tụụrụ ime ọzọ mụọkwa nwa nwoke. O kwuru sị, “Onyenwe anyị anụla na m bụ nwanyị a kpọrọ asị, ọ bụ ya mere o ji nye m nwa nwoke ọzọ.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Simiọn.
GEN 29:34 Lịa tụrụ ime ọzọ, mgbe ọ mụrụ nwa nwoke, o kwuru sị, “Nʼezie, ugbu a ka di m ga-arapara m nʼahụ, nʼihi na amụọrala m ya ụmụ ndị ikom atọ.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Livayị.
GEN 29:35 Ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke. O kwuru sị, “Ugbu a aga m eto Onyenwe anyị.” Ya mere, ọ kpọrọ aha ya Juda. Lịa mụsịrị nwa a kwụsị ịmụ ụmụ.
GEN 30:1 Rechel hụrụ na ya amụghị nwa ọbụla nye Jekọb, o kworo ekworo megide nwanne ya nwanyị. Ya mere, ọ sịrị Jekọb, “Nye m ụmụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m anwụ.”
GEN 30:2 Jekọb were iwe megide Rechel, sị ya, “Abụ m Chineke onye gbochiri gị mkpụrụ nke afọ?”
GEN 30:3 Mgbe ahụ Rechel gwara Jekọb sị ya, “Lee odibo m nwanyị Bilha, bakwuru ya ka ọ mụọ nwa nʼikpere m abụọ, ka mụ onwe m site na ya bụrụkwa onye mụtara ụmụ.”
GEN 30:4 Rechel nyere Jekọb Bilha, odibo nwanyị ya, Jekọb bakwuuru ya.
GEN 30:5 Bilha tụụrụ ime mụọra Jekọb nwa nwoke.
GEN 30:6 Nke a mere ka Rechel kwuo sị, “Chineke ekpepụtala m. Ọ nụla arịrịọ m nye m nwa nwoke.” Nʼihi nke a, Rechel gụrụ nwa ahụ Dan.
GEN 30:7 Bilha, odibo nwanyị Rechel, tụụrụ ime ọzọ mụtara Jekọb nwa nwoke nke abụọ.
GEN 30:8 Rechel kwuru sị, “Mgba dị ukwuu ka mụ na nwanne m nwanyị gbara, m merie.” Ọ kpọọ ya Naftalị.
GEN 30:9 Lịa hụrụ na ya akwụsịla ịmụ nwa, ọ kpọọrọ Zilpa, odibo ya nwanyị kpọnye Jekọb ka ọ bụrụ nwunye ya.
GEN 30:10 Zilpa, odibo nwanyị Lịa, mụtara Jekọb nwa nwoke.
GEN 30:11 Mgbe nke a mere, Lịa kwuru sị, “Nke a bụ ihuọma.” Ọ kpọrọ nwa ahụ Gad.
GEN 30:12 Zilpa, odibo nwanyị Lịa mụtaara Jekọb nwa nwoke nke abụọ.
GEN 30:13 Mgbe ahụ Lịa kwuru sị, “Ọṅụ ejula m obi, nʼihi na ụmụ nwanyị ibe m ga-akpọ m onye ihe na-agara nke ọma.” Lịa kpọrọ nwantakịrị nwoke ahụ Asha.
GEN 30:14 Otu ụbọchị, nʼoge a na-aghọ ọka wiiti, Ruben nwa Lịa, gara nʼọhịa hụ ahịhịa a na-akpọ mandreki. Ọ kụtaara nne ya ụfọdụ nʼime ahịhịa a. Mgbe Rechel hụrụ ahịhịa a, ọ rịọrọ Lịa sị ya, “Biko nyetụ m ụfọdụ nʼime mandreki ndị a nwa gị nwoke kụtara.”
GEN 30:15 Ma Lịa zara sị ya, “O zubeere gị na ị napụrụ m di m? Ị chọkwara ịnapụ m mandreki ndị a nwa m nwoke wetaara m?” Rechel zara Lịa sị, “Ọ dị mma, ka gị na ya dinaa nʼabalị a ka ọ bụrụ ihe mgbanwo maka mandreki nwa gị nwoke.”
GEN 30:16 Ya mere, mgbe Jekọb si nʼọhịa na-alọbata nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, Lịa pụrụ izute ya, sị ya, “Ị ga-abakwute m nʼihi na m ejirila m ahịhịa mandreki nwa m nwoke m zụta gị.” Ha dinara nʼabalị ahụ.
GEN 30:17 Chineke nụrụ olu Lịa, ọ tụụrụ ime mụtara Jekọb nwa nwoke nke ise.
GEN 30:18 Lịa sịrị, “Chineke akwụọla m ụgwọ maka odibo m nwanyị m nyere di m.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Isaka.
GEN 30:19 Lịa tụkwaara ime ọzọ mụtara Jekọb nwa nwoke nke isii.
GEN 30:20 Ugbu a Lịa kwuru sị, “Chineke enyela m ezi onyinye dị oke ọnụ. Ugbu a, di m ga-eji nkwanye ugwu leta m nʼihi na amụọrala m ya ụmụ ndị ikom isii.” Ọ kpọrọ aha ya Zebụlọn.
GEN 30:21 Emesịa, Lịa mụrụ nwa nwanyị, kpọọ ya Daịna.
GEN 30:22 Chineke chetara Rechel. Ọ nụrụ olu ya, meghee akpanwa ya.
GEN 30:23 Nʼihi ya, Rechel tụụrụ ime mụta nwa nwoke. Ọ sịrị, “Chineke ewepụla nkọcha dịịrị m.”
GEN 30:24 Rechel kpọrọ aha ya Josef, dị ka ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị nyekwa m nwa nwoke ọzọ.”
GEN 30:25 Mgbe Rechel mụsịrị Josef, Jekọb jekwuru Leban sị ya, “Zilaga m ka m laghachi nʼebe m na ala nke m.
GEN 30:26 Kpọnye m ndị nwunye m, ndị m ji nʼihi ha gbara gị odibo, ha na ụmụ m, ka m lakwaa. Ị maara otu m siri gbaara gị odibo. Kpọnye m ha ka m duru ha laghachi ebe m si bịa.”
GEN 30:27 Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụrụ na m achọtala amara nʼihu gị biko nọdụ, nʼihi na esi m nʼịgba afa chọpụta na Onyenwe anyị agọziela m nʼihi gị.”
GEN 30:28 Leban sịrị, “Kwuo ego ole ị chọrọ ka m kwụọ gị, aga m akwụ ya.”
GEN 30:29 Jekọb zara sị Leban, “Gị onwe gị maara otu m si gbara gị odibo na ihe mere igwe anụ ụlọ gị ndị m lekọtara.
GEN 30:30 Nʼihi na ole na ole ka i nwere mgbe m bịara, ma ugbu a, ha abaala ụba nke ukwuu. Onyenwe anyị esitela nʼụkwụ m gọzie gị. Ugbu a, kedụ mgbe m ga-arụkwanụ ọrụ nke mụ onwe m maka ezinaụlọ m?”
GEN 30:31 Leban jụrụ Jekọb sị, “Kedụ ihe m ga-enye gị?” Jekọb gwara ya sị, “Enyela m ihe ọbụla, kama o nwere otu ihe m chọrọ ka i mee. Ọ bụrụ na i mee ya, aga m alaghachi ilekọta igwe anụ ụlọ gị.
GEN 30:32 Kwere ka m jegharịa nʼetiti igwe anụ ụlọ gị, ka m họpụta site nʼetiti igwe atụrụ gị ndị niile tụrụ agwa agwa, na ụmụ atụrụ niile dị oji, na ewu niile tụrụ agwa agwa. Atụrụ na ewu ndị a niile m ga-ahọpụta ga-abụ ụgwọ ọrụ m.
GEN 30:33 Ezi omume m ga-azara nʼọdịnihu, mgbe ọbụla ị bịara nyochaa ụgwọ ọrụ ị kwụrụ m. Ewu ọbụla na-atụghị agwa agwa, maọbụ atụrụ ọbụla na-ejighị oji ị chọpụtara nʼetiti igwe ewu na atụrụ nke m ka a ga-agụ dị ka ihe e zuru nʼohi.”
GEN 30:34 Leban zara sị ya, “Ọ dị mma. Ya dịrị dịka i kwuru.”
GEN 30:35 Nʼotu ụbọchị ahụ, ọ họpụtachara mkpi niile tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nne ewu niile ndị nwere tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nke ọbụla nwere ajị ọcha nʼahụ ya. Ọ họpụtakwara atụrụ ojii niile, nyefee ha nʼaka ụmụ ya ka ha lekọtaa ha.
GEN 30:36 Leban jere ije abalị atọ nke kewapụrụ ha site nʼebe Jekọb nọ. Ma Jekọb nọgidere na-elekọta igwe anụ ụlọ Leban ndị ọzọ.
GEN 30:37 Mgbe ahụ Jekọb gara gbute ngalaba osisi pọpla, na osisi alụmọnd, na osisi plenụ, kpechapụ ahụ agbụgbọ osisi ndị a, si otu a mee ka ime ime ngalaba osisi ndị a dị ọcha pụta ìhè.
GEN 30:38 Ọ tọgbọrọ osisi ndị a o kpechapụtara nʼebe ewu na atụrụ ndị a na-aṅụ mmiri, ka ha cherịta ịhụ ebe igwe anụ ụlọ ndị a nọ mgbe ọbụla ha na-aṅụ mmiri. Nke a mere mgbe igwe anụ ụlọ ndị a na-enwe ekpomọkụ nke ịgba ibe ha, nʼoge ha bịara ịṅụ mmiri,
GEN 30:39 ọ bụ nʼihu ngalaba osisi ndị a ka ha na-anọ na-agba onwe ha. Mgbe anụ ụlọ ndị a mụrụ ụmụ, ahụ ụmụ ha na-atụ agwa agwa maọbụ nwe ntụpọ.
GEN 30:40 Jekọb na-edo ụmụ igwe ewu na atụrụ ndị a nʼotu akụkụ, ma ọ na-eme ka anụ ụlọ ndị ọzọ chee ihu ha nʼanụ ụlọ Leban ndị tụrụ agwa agwa, maọbụ na-eji oji. Nʼụzọ dị otu a, ọ kewapụtaara onwe ya anụ ụlọ nke ya. O tinyekọtaghị ha nʼanụ ụlọ Leban.
GEN 30:41 Mgbe ọbụla nne anụ ụlọ ndị ahụ siri ike nọ nʼọnọdụ ịtụrụ ime, Jekọb na-edobe ngalaba osisi ndị ahụ nʼakụkụ ebe ha na-aṅụ mmiri nʼihu ha, ka ha nọrọ nʼebe ahụ gbaa onwe ha.
GEN 30:42 Ma ọ bụrụ na anụ ụlọ ndị ahụ adịghị ike, Jekọb anaghị edebe osisi ndị a nʼihu ha. Ya mere, igwe ewu na atụrụ ndị na-esighị ike gaara Leban. Ma ndị siri ike gaara Jekọb.
GEN 30:43 Site nʼụzọ dị otu a, Jekọb ghọrọ onye nwere akụ hie nne. O nwekwara ọtụtụ igwe anụ ụlọ na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi nwoke na nwanyị, na ọtụtụ ịnyịnya kamel, na ọtụtụ ịnyịnya ibu ndị ọzọ.
GEN 31:1 Jekọb nụrụ na ụmụ ndị ikom Leban na-asị, “Jekọb ewerechaala ihe niile nna anyị nwere. O sitere nʼihe nna anyị nwere kpata akụnụba ya niile.”
GEN 31:2 Jekọb hụkwara na omume Leban nʼebe ọ nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ.
GEN 31:3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Jekọb, “Laghachi nʼala nna gị ha, lakwuru ụmụnna gị, aga m anọnyere gị.”
GEN 31:4 Ya mere, Jekọb ziri Rechel na Lịa ozi ka ha bịakwute ya nʼọhịa ebe ọ nọ na-elekọta igwe anụ ụlọ ya.
GEN 31:5 Ọ sịrị ha, “Ahụla m na omume nna unu nʼebe m nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ. Ma Chineke nna m ha nọnyeere m.
GEN 31:6 Unu maara na eji m ike m niile rụọra nna unu ọrụ.
GEN 31:7 Ma nna unu ghọgburu m, gbanwee ụgwọ ọrụ m ugboro iri. Otu ọ dị, Chineke ekweghị ka nna unu merụọ m ahụ.
GEN 31:8 Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị tụrụ agwa agwa ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-abụ ndị tụrụ agwa. Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị niile nwere ntụpọ ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-enwe ntụpọ ọcha nʼahụ ha.
GEN 31:9 Chineke napụrụ nna unu anụ ụlọ ya ma nye m ha.
GEN 31:10 “Nʼoge ụmụ anụ ụlọ ji atụ ime, eweliri m anya hụ na nrọ na ụmụ mkpi niile na-agba igwe nne ewu bụ ụmụ mkpi ndị tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha nʼahụ ha.
GEN 31:11 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke sịrị m na nrọ, ‘Jekọb.’ Azara m sị, ‘Lee m nʼebe a.’
GEN 31:12 Ọ sịrị m, ‘Lelie anya gị elu, lee ka ị hụ na mkpi niile na-agba igwe nne ewu ndị a bụ mkpi ndị ahụ tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha. Nʼihi na ahụla m ihe niile Leban na-eme gị.
GEN 31:13 Mụ onwe m bụ Chineke nke Betel, ebe ị wụkwasịrị mmanụ nʼogidi nkume ahụ, ebe ị kwekwara m nkwa. Ugbu a, kulie, hapụ obodo a, laghachi nʼala a nọ mụọ gị.’ ”
GEN 31:14 Rechel na Lịa zara sị ya, “Anyị ka nwere oke nʼihe nketa nʼụlọ nna anyị?
GEN 31:15 Ọ bụghị dịka ndị ọbịa ka ọ gụnyeziri anyị? Nʼihi na o reela anyị, ripịakwa ụgwọ isi anyị.
GEN 31:16 Nʼezie, akụ ndị ahụ Chineke napụrụ nna anyị bụ nke anyị na nke ụmụ anyị. Ya mere, mee ihe ọbụla Chineke sị gị mee.”
GEN 31:17 Jekọb biliri, kukwasị ụmụ ya na ndị nwunye ya nʼelu ịnyịnya kamel,
GEN 31:18 duru igwe anụ ụlọ ya niile, na ihe ọ kpatara na Padan Aram, lakwuru nna ya Aịzik nʼala Kenan.
GEN 31:19 Ka Leban gara ịkpachapụ ajị ụmụ atụrụ ya, Rechel zuuru arụsị ezinaụlọ nna ya.
GEN 31:20 Jekọb ghọkwara Leban onye Aram aghụghọ nʼihi na ọ gwaghị ya na ọ na-agbapụ ọsọ.
GEN 31:21 Ya mere, o buru ihe niile o nwere gbapụ ọsọ, gbafee iyi ukwu Yufretis, chee ihu nʼala ugwu ugwu Gilead.
GEN 31:22 Abalị atọ agafeelarị tupu a gwa Leban na Jekọb agbalaala.
GEN 31:23 O duuru ndị ikwu ya chụọ Jekọb ọsọ abalị asaa tupu ọ chụkwute ya nʼala ugwu ugwu Gilead.
GEN 31:24 Ma Chineke bịakwutere Leban onye Aram na nrọ nʼabalị sị ya, “Kpachapụ anya gị, hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.”
GEN 31:25 Jekọb amaala ụlọ ikwu ya nʼala ugwu Gilead mgbe Leban chụkwutere ya. Leban na ndị ikwu ya makwara ụlọ ikwu nke ha nʼebe ahụ.
GEN 31:26 Leban sịrị Jekọb, “Gịnị bụ ihe a i mere? Ị ghọgbuola m. I burula ụmụ m ndị inyom dịka ndị a dọtara nʼagha?
GEN 31:27 Gịnị mere i ji ghọgbuo m, zoro ezo gbapụ? Gịnị mere ị gwaghị m ka m jiri ọṅụ na ịbụ abụ nke ya na ịkpọ ụbọ akwara na iti ịgba so, zilaga gị?
GEN 31:28 Gịnị mere i nyeghị m ohere ka m sutu ụmụ ụmụ m na ụmụ m ndị inyom ọnụ sị ha laa nke ọma? Omume a i mere bụ omume nzuzu.
GEN 31:29 Enwere m ike merụọ gị ahụ ugbu a, ma Chineke nke nna gị mere ka m hụ ya anya na nrọ nʼabalị gara aga. Ọ dọrọ m aka na ntị sị m, ‘Kpachapụ anya gị hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.’
GEN 31:30 Ugbu a, ị na-ala nʼihi na ọ gụrụ gị agụụ ịlaghachi nʼụlọ nna gị, ma gịnị mere i ji zuru chi m?”
GEN 31:31 Jekọb zara sị Leban, “Nʼihi na m tụrụ egwu, nʼihi na m chere sị na ị ga-eji ike napụ m ụmụ gị ndị inyom a.
GEN 31:32 Ma ọ bụrụ na ị chọta onye ọbụla ji chi gị ndị a, onye ahụ ga-anwụ. Nʼihu ndị ikwu gị ndị a, chọgharịa nʼonwe gị, lee ma ị ga-achọta ihe ọbụla bụ nke gị dị m nʼaka. Ọ bụrụ na ị chọta ya, were ya.” Ma Jekọb amaghị na Rechel zuuru chi ndị ahụ.
GEN 31:33 Ya mere, Leban bara nʼụlọ ikwu Jekọb, na nʼime ụlọ ikwu Lịa, na nʼime ụlọ ikwu ndị odibo nwanyị abụọ ya, ma o nweghị ihe ọ chọtara. O sitere nʼụlọ ikwu Lịa pụta baa nʼụlọ ikwu Rechel.
GEN 31:34 Nʼoge a, Rechel ewerela arụsị ezinaụlọ ndị ahụ tinye ha nʼime akwa e ji anọkwasị nʼelu ịnyịnya kamel nọdụ ọdụ nʼelu ya. Leban chọgharịrị ebe niile nʼime ụlọ ikwu ahụ ma ọ chọtaghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.
GEN 31:35 Mgbe ahụ, Rechel gwara nna ya Leban sị, “Biko, ewela iwe nna m ukwu, nʼihi na enweghị m ike ibili ọtọ nʼihu gị. Anọ m nʼọnọdụ ndị inyom na-anọ kwa ọnwa.” Leban chọgharịrị ebe niile, ma ọ hụghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.
GEN 31:36 Iwe were Jekọb megide Leban. O ji iwe jụọ Leban sị, “Gịnị bụ njehie m? Gịnị bụ mmehie m mere i ji si otu a na-achụsi m ike?
GEN 31:37 Ugbu a, ị chọgharịala nʼibu m niile, gịnị ka ị chọtara bụ nke gị? Wepụta ya nʼihu ndị ikwu gị na nʼihu ndị nke m, ka ha kpeere mụ na gị ikpe.
GEN 31:38 “Iri afọ abụọ ka mụ na gị nọrọ. O nweghị mgbe ime pụrụ ụmụ ewu na atụrụ gị; o nwekwaghị mgbe m riri ebule si nʼigwe anụ ụlọ gị.
GEN 31:39 O nweghị mgbe m welataara gị anụ ụlọ nke anụ ọhịa dọgburu, kama akwụrụ m ụgwọ ha. I mekwara ka m kwụghachi gị anụ ụlọ ọbụla e zuru nʼohi, maọbụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị.
GEN 31:40 Nʼime oke anwụ nke ehihie ka m rụụrụ gị ọrụ. Rụọkwara gị ọrụ nʼoge oyi na-atụ, nʼabalị ụra sikwa nʼanya m pụọ.
GEN 31:41 Otu a ka ọ dịrị m iri afọ abụọ m jeere gị ozi. Arụrụ m gị ọrụ afọ iri na anọ maka ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a, afọ isii ka m lekọtara igwe ewu na atụrụ gị. Ị nọkwa nʼime ihe ndị a gbanwee ụgwọ ọrụ m ugboro iri.
GEN 31:42 A sị na Chineke m, Chineke Ebraham, onye ahụ a na-atụ egwu nke Aịzik, anọnyereghị m, ị gaara ezilaga m nʼaka efu, agaara m agbara aka laa. Ma Chineke ahụla ịrụsị ọrụ ike m, na nhụju anya m niile, ọ bụ ya mere o ji baara gị mba nʼabalị gara aga.”
GEN 31:43 Mgbe ahụ Leban zaghachiri sị Jekọb, “Ndị inyom ndị a bụ ụmụ m. Ụmụaka ndị a bụ ụmụ m. Igwe anụ ụlọ ndị a bụ nke m. Ihe ndị a niile ị na-ahụ anya bụ nke m. Olee otu m ga-esi merụọ ụmụ m, na ụmụ ụmụ m ahụ?
GEN 31:44 Ugbu a, bịa ka anyị gbaa ndụ mụ na gị, ka ọ bụrụ ihe ama nʼetiti anyị.”
GEN 31:45 Ya mere, Jekọb weere otu nkume guzo ya ọtọ dịka ogidi.
GEN 31:46 Jekọb gwakwara ndị so ya sị ha, “Tụtụkọta nkume.” Ha tụtụkọtara nkume wụsa ha nʼotu ebe mee ka ọ laa elu. Emesịa, ha nọdụrụ nʼakụkụ nkume ndị ahụ rie nri.
GEN 31:47 Leban kpọrọ nkume ndị ahụ Jega-Sahaduta, nʼasụsụ nke ya. Jekọb kpọrọ ya Galeed, nʼasụsụ nke ya.
GEN 31:48 Emesịa, Leban sịrị, “Ka nkume ndị a bụrụ ihe ama nʼetiti mụ na gị taa.” Nke a mere e ji kpọọ ya Galeed.
GEN 31:49 A kpọkwara ya Mizpa, nʼihi na Leban sịrị, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ga-eche mụ na gị nche ịhụ na onye ọbụla nʼime anyị debere ọgbụgba ndụ a, mgbe anyị na-anọghị ibe anyị nso.
GEN 31:50 Ọ bụrụ na i mee ụmụ m ndị inyom ihe ọjọọ, maọbụ lụọ ndị inyom ndị ọzọ tinyere ha, o nweghị onye nʼime anyị ga-amata, ma cheta na Chineke ga-abụ onyeama nʼetiti mụ na gị.”
GEN 31:51 Leban gwakwara Jekọb sị, “Lee nkume ndị a a wụsara nʼebe a na ogidi m mere ka o guzo nʼetiti mụ na gị.
GEN 31:52 Nkume ndị a a wụsara bụ akaebe, ogidi a bụkwa ihe ama. Agaghị m agabiga nkume ndị a a wụsara gafeeta nʼakụkụ nke gị ime gị ihe ọjọọ. Gị onwe gị agaghị agabiga nkume ndị a a wụsara na ogidi a gafeeta nʼakụkụ nke m ime m ihe ọjọọ.
GEN 31:53 Ka Chineke Ebraham na Chineke Nahọ, Chineke nna ha, bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị.” Ya mere Jekọb ji onye ahụ a na-atụ egwu nke nna ya Aịzik ṅụọ iyi.
GEN 31:54 Ọ chụrụ aja nʼala ugwu ugwu ahụ, kpọọ ndị ikwu ya niile oriri. Mgbe ha richara nri, ha rahụrụ ụra nʼebe ahụ.
GEN 31:55 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Leban biliri sutu ụmụ ya ndị inyom na ụmụ ụmụ ya ọnụ. Ọ gọziri ha, hapụ ha laghachi ụlọ ha.
GEN 32:1 Jekọb nʼonwe ya hapụrụ gawa nʼihu nʼije ya. Ndị mmụọ ozi Chineke zutere ya nʼụzọ.
GEN 32:2 Mgbe Jekọb hụrụ ha, o kwuru sị, “Ebe a bụ ụlọ ikwu Chineke!” Ọ kpọrọ ebe ahụ, Mahanaim.
GEN 32:3 Mgbe ahụ, Jekọb zipụrụ ndị ozi ka ha jee hụ Ịsọ nwanne ya nwoke nʼala Sia, nʼobodo Edọm.
GEN 32:4 O ziri ha ozi sị, “Ihe a bụ ihe unu ga-agwa nna m ukwu Ịsọ, ‘Odibo gị Jekọb kwuru sị, Ọ bụ na nke Leban ka m jere kemgbe, ọ bụkwa ebe ahụ ka m nọ ruo ugbu a.
GEN 32:5 Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’ ”
GEN 32:6 Mgbe ndị ozi ahụ lọghachikwutere Jekọb, ha gwara ya sị ya, “Anyị jekwuru nwanne gị nwoke Ịsọ dị ka i ziri anyị. Ugbu a, ọ na-abịa. Ọ chị narị ndị ikom anọ na-abịa izute gị.”
GEN 32:7 Ụjọ tụrụ Jekọb nke ukwuu, obi ya jupụtakwara na nsogbu. Nʼihi nke a, o kewara ndị niile so ya ụzọ abụọ, tinyere anụ ụlọ ya, na igwe ehi ya na ịnyịnya kamel ya.
GEN 32:8 O chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na Ịsọ alụso otu nʼime ụzọ abụọ a ọgụ, otu ụzọ fọdụrụ ga-enwe ike gbalaga.”
GEN 32:9 Mgbe ahụ, Jekọb kpere ekpere sị, “Chineke nke nna m Ebraham, Chineke nke nna m Aịzik, Onyenwe anyị, gị onye gwara m sị, ‘Laghachi nʼala gị na nʼebe ụmụnna gị nọ, aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma.’
GEN 32:10 Ekwesighị m obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi nke i gosiri ohu gị. Mgbe m gabigara Jọdan a, enweghị m ihe ọbụla karịa mkpanaka m, ma ugbu a, abụ m ọmụma ụlọ ikwu abụọ.
GEN 32:11 Zọpụta m, arịọ m gị, site nʼaka nwanne m Ịsọ, nʼihi na egwu na-atụ m na ọ ga-abịa lụso m agha, lụsokwa ndị nne a na ụmụntakịrị ha agha.
GEN 32:12 Ọ bụ gị kwuru sị, ‘Aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma, meekwa ka ụmụ ụmụ gị dịrị ka aja nke dị nʼọnụ osimiri, nke mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ”
GEN 32:13 Jekọb rahụrụ nʼebe ahụ nʼabalị ahụ. Site nʼihe niile o nwere, ọ họpụtara onyinye ọ ga-enye nwanne ya Ịsọ.
GEN 32:14 Ọ kwadoro inye ya: narị nne ewu abụọ (200), iri mkpi abụọ (20), narị nne atụrụ abụọ (200), iri ebule abụọ (20)
GEN 32:15 Iri nne ịnyịnya kamel atọ (30) na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ (40), oke ehi iri (10), iri nne ịnyịnya ibu abụọ (20), oke ịnyịnya ibu iri (10).
GEN 32:16 O weere onyinye ndị a niile nyefee nʼaka ndị ozi ya nʼusoro dịka ụdị ha si dị. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị ha, “Burunu ụzọ na-aga, meenụ ka ohere dị nʼetiti igwe anụ na igwe ibe ya.”
GEN 32:17 O nyere onye mbụ iwu sị ha, “Mgbe Ịsọ nwanne m zutere unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Onye bụ nna unu ukwu? Ebee ka unu na-aga? Onye nwe anụ ụlọ ndị a niile unu chị na-aga?’
GEN 32:18 Unu ga-aza sị ya, ‘Anụ ụlọ ndị a bụ nke ohu gị Jekọb. Ha bụ onyinye e zitere onyenwe m Ịsọ, lee ka ọ na-abịa nʼazụ anyị.’ ”
GEN 32:19 Otu ozi ahụ ka Jekọb ziri onye nke abụọ na onye nke atọ, na ndị ọzọ niile chị igwe anụ ụlọ, sị ha, “Unu ga-agwa Ịsọ otu ihe ahụ mgbe unu zutere ya.
GEN 32:20 Hụkwanụ na unu gwara ya sị, ‘Ohu gị Jekọb nọ nʼazụ anyị.’ ” Echiche ya bụ, “Aga m eji onyinye ndị a niile m na-ezipụrụ ya mee ka obi ya dajụọ, nke ọ ga-abụ mgbe mụ na ya zutere, ma eleghị anya, ọ ga-anabata m.”
GEN 32:21 Mgbe o zipụchasịrị onyinye ndị ahụ niile, Jekọb rahụrụ ụra nʼụlọ ikwu ya nʼabalị ahụ.
GEN 32:22 Nʼabalị ahụ, Jekọb biliri duru ndị nwunye ya abụọ na ndị odibo nwanyị ya abụọ, na ụmụ ya iri na otu, site nʼebe na-adịghị omimi nke iyi Jabọk kpọfee ha.
GEN 32:23 Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere.
GEN 32:24 Emesịa, Jekọb lọghachiri nọdụ naanị ya. Mgbe ahụ, otu nwoke bịara gbaso ya mgba. Ha abụọ gbagidere mgba a tutu chi ebido ịbọ.
GEN 32:25 Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọ pụghị imeri Jekọb na mgba ahụ, o tiri Jekọb aka nʼọkpụ, mee ka ọkpụ ya hịkwapụ site nʼọnọdụ ya.
GEN 32:26 Mgbe nke a mesịrị, nwoke ahụ gwara Jekọb sị ya: “Hapụ m aka ka m laa, nʼihi na chi ebidola ịbọ.” Ma Jekọb zara sị ya, “Ọ bụ naanị mgbe ị gọziri m ka m ga-ahapụ gị ka ị laa.”
GEN 32:27 Mgbe ahụ nwoke ahụ jụrụ Jekọb ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Aha m bụ Jekọb.”
GEN 32:28 Nwoke ahụ zara sị ya, “Aha gị agaghị abụkwa Jekọb, kama ọ ga-abụ Izrel, nʼihi na gị na Chineke na ndị mmadụ gbara mgba, ị mmeri.”
GEN 32:29 Jekọb sịrị, “Biko gwa m aha gị.” Ma ọ zaghachiri, “Gịnị mere ị ji ajụ aha m?” Mgbe ahụ, ọ gọziri ya nʼebe ahụ.
GEN 32:30 Jekọb kpọrọ aha ebe ahụ Peniel, nʼihi na ọ sịrị, “Ahụla m Chineke ihu na ihu, ma e chebere ndụ m.”
GEN 32:31 Anyanwụ awaala mgbe Jekọb si Peniel gafee. Ma nʼihi ihe mere ya nʼọkpụ, ọ naghị agazikwa ije.
GEN 32:32 Ọ bụ ihe a mere ụmụ Izrel adịghị eri akwara anụ jikọtara ukwu anụ na ọkpụ ya ruo taa. Nʼihi na ihe ahụ mere Jekọb metụtara akwara ukwu ya.
GEN 33:1 Jekọb lepụrụ anya nʼihu, hụ Ịsọ ka ọ na-abịa, ya na narị ndị ikom anọ ndị so ya. Nʼihi ya, o kesara ụmụntakịrị ndị ahụ, nʼetiti Lịa, na Rechel na ndị odibo nwanyị ya abụọ.
GEN 33:2 O mere ka ndị odibo nwanyị ya abụọ ahụ na ụmụ ha buru ụzọ, Lịa na ụmụ ya esoro nʼazụ, ebe Rechel na Josef nọ nʼazụ azụ.
GEN 33:3 Ma ya onwe ya buru ụzọ na-aga nʼihu ha niile, na-akpọ isiala nye Ịsọ ugboro asaa, tutu ruo mgbe ọ bịarutere nwanne ya nwoke nso.
GEN 33:4 Ma Ịsọ gbaara ọsọ bịakwute ya, makụọ ya, jikụọ ya aka nʼolu, sutu ya ọnụ. Ha abụọ kwara akwa.
GEN 33:5 Mgbe Ịsọ lelitere anya hụ ndị inyom ndị a na ụmụntakịrị ndị ahụ. Ọ sịrị, “Ndị ole bụ ndị a gị na ha so?” Jekọb sịrị, “Ha bụ ụmụ Chineke sitere nʼamara ya nye ohu gị.”
GEN 33:6 Mgbe ahụ, ndị odibo nwanyị abụọ na ụmụ ha rutere nso, kpọọ isiala.
GEN 33:7 Lịa na ụmụ ya bịarutekwara kpọọ isiala, nʼikpeazụ Rechel na Josef bịara kpọọkwa isiala.
GEN 33:8 Ịsọ sịrị, “Igwe ewu na atụrụ ndị a niile m zutere nʼụzọ, gịnị ka ọ pụtara?” Jekọb zara, “Ha bụ maka ịnata ihuọma nʼaka gị, onyenwe m.”
GEN 33:9 Ma Ịsọ sịrị, “Nwanne m nwoke, debere onwe gị ihe i nwere, nʼihi na enwere m akụ hie nne.”
GEN 33:10 Jekọb sịrị, “E, biko, ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nara m onyinye ndị a. Nʼihi na ịhụ gị anya dịka ilekwasị Chineke anya nʼihu, nke ka nke, otu a i ji ihu ọcha nabata m.
GEN 33:11 Biko nara onyinye ndị ahụ e wetaara gị, nʼihi na Chineke emelara m amara. Enwekwara m ihe ga-ezuru m.” Jekọb kwagidere ya, ọ naara onyinye ndị ahụ.
GEN 33:12 Mgbe ahụ, Ịsọ sịrị, “Bilienụ ka anyị malite ije ịlaghachi. Aga m esonyere unu.”
GEN 33:13 Ma Jekọb sịrị ya, “Onyenwe m, ị maara na ụmụntakịrị ndị a adịghị ike, aga m ejikwa nwayọọ chịa ụmụ atụrụ ndị a na ehi ndị na-enye ụmụ ha ara. Ọ bụrụ na a chịa ha nʼike nʼime otu ụbọchị, ụmụ anụmanụ ndị a niile ga-anwụ.
GEN 33:14 Ya mere, ka onyenwe m buru ohu ya ụzọ na-aga, ma ka m jiri nwayọọ nwayọọ na-abịa, dịka ike igwe anụ ndị a na ụmụaka ndị a si dị. Tutu ruo mgbe m ga-ezute onyenwe m na Sia.”
GEN 33:15 Ịsọ sịrị, “Ọ bụrụ otu a, ka m hapụrụ gị ụfọdụ ndị a mụ na ha so.” Ma Jekọb sịrị, “Nʼihi gịnị kwanụ? Ka m hụta naanị ihuọma nʼanya onyenwe m.”
GEN 33:16 Ịsọ laghachikwara azụ na Sia nʼotu ụbọchị ahụ.
GEN 33:17 Ma Jekọb na ezinaụlọ ya jere Sukọt, ebe o wuuru onwe ya ụlọ obibi, wuokwara anụ ụlọ ya ụlọ obibi ha. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ Sukọt.
GEN 33:18 Mgbe Jekọb si Padan Aram lọghachi, o rutere obodo Shekem nke dị nʼala Kenan nʼudo. O mara ụlọ ikwu ya nʼihu obodo ahụ.
GEN 33:19 Ọ zụrụ ala ebe o mara ụlọ ikwu ya nʼaka ụmụ Hamọ, nna Shekem, ọ kwụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha maka ala ahụ.
GEN 33:20 Nʼebe ahụ, o wuru ebe ịchụ aja, kpọọ aha ya El Elohe Izrel.
GEN 34:1 Ugbu a, Daịna nwa nwanyị Lịa mụụrụ Jekọb pụrụ ileta ndị inyom ala ahụ.
GEN 34:2 Mgbe Shekem, nwa Hamọ onye Hiv, onye na-achị mpaghara ahụ, hụrụ ya, ọ kpọọrọ ya jiri ike ya na ya dinaa.
GEN 34:3 Mkpụrụobi ya gara nʼebe Daịna nwa Jekọb, ọ hụrụ nwantakịrị nwanyị ahụ nʼanya, gwakwa ya okwu dị nro.
GEN 34:4 Shekem sịrị nna ya bụ Hamọ “Lụtara m nwaagbọghọ a, ka ọ bụrụ nwunye m.”
GEN 34:5 Mgbe Jekọb nụrụ na e merụrụ Daịna nwa ya nwanyị, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom nọ nʼọhịa ebe ha na-azụ anụ ụlọ, ọ gbara nkịtị na-emeghị ihe ọbụla ruo mgbe ha lọtara.
GEN 34:6 Hamọ bụ nna Shekem, pụkwuuru Jekọb ka ha kparịta ụka.
GEN 34:7 Ụmụ ndị ikom Jekọb si nʼọhịa na-alọta mgbe ha nụrụ ihe merenụ, iwe na ọnụma juputara ha obi nke ukwuu nʼihi na Shekem mere ihe na-eweta ihere nʼIzrel site nʼidinakwuru ada Jekọb, ihe a na-ekwesighị ime eme.
GEN 34:8 Ma Hamọ sịrị ha, “Nwa m nwoke Shekem hụrụ nwa unu nwanyị nʼanya. Biko, kwerenụ ka ọ lụọ ya.
GEN 34:9 Kwerenụ ka anyị na unu na-alụrịta. Ka anyị na-alụ ụmụ ndị inyom unu, ka unu na-alụkwa ụmụ ndị inyom anyị.
GEN 34:10 Unu nwere ike biri nʼetiti anyị. Ala a ghere oghe nye unu. Birinụ nʼime ya, na-azụkwanụ ahịa nʼime ya, nwekwanụ akụ nʼime ya nye onwe unu.”
GEN 34:11 Shekem gwara nna na ụmụnne Daịna ndị ikom sị, “Kwerenụ ka m chọta ihuọma nʼebe unu nọ, aga m enyekwa unu ihe ọbụla unu chọrọ ka m nye unu.
GEN 34:12 Ihe ọbụla unu sị m kwụọ dịka ego akụ ọlụlụ nwunye, ya na onyinye ọbụla unu si m nye aga m enye unu. Naanị kwerenụ ka nwaagbọghọ a bụrụ nwunye m.”
GEN 34:13 Ma ụmụ Jekọb jiri aghụghọ zaa Shekem na Hamọ nna ya mgbe ha na-agwa ha okwu, nʼihi na e merụrụ Daịna nwanne ha nwanyị.
GEN 34:14 Ha sịrị ha, “Anyị enweghị ike ime ihe a, ị kpọrọ nwanne anyị nwanyị kpọnye nwoke a na-ebighị ugwu. Nke a ga-abụrụ anyị ihe ihere.
GEN 34:15 Anyị nwere ike ikwenye ka ọ lụọ ya ma ọ bụrụ na unu ga-adị ka anyị, ka e bie ndị nwoke unu niile ugwu.
GEN 34:16 Mgbe ahụ anyị ga-edunye unu ụmụ ndị inyom anyị, ma kpọrọkwa ụmụ ndị inyom unu dịka ndị nwunye anyị. Anyị ga-ebi nʼetiti unu, soro unu bụrụ otu ndị.
GEN 34:17 Ọ bụrụ na unu agaghị ekwe ka e bie unu ugwu, anyị ga-akpọrọ nwanne anyị nwanyị laa.”
GEN 34:18 Obi tọrọ Hamọ na Shekem nwa ya nwoke ụtọ nʼihi ihe ụmụ ndị ikom Jekọb kwuru.
GEN 34:19 Nwokorobịa ahụ bụ onye a na-asọpụrụ karịa onye ọbụla nʼụlọ nna ya egbughị oge ime ihe ha kwuru, nʼihi na ihe banyere nwa nwanyị Jekọb dị ya mma nke ukwuu.
GEN 34:20 Emesịa, Hamọ na Shekem nwa ya nwoke gara nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha gwa ndị ikom obodo ha okwu, sị.
GEN 34:21 “Ndị ikom ndị a nwere mmasị nʼebe anyị nọ. Kwerenụ ka ha biri nʼala anyị, ka ha na-agagharị kwa nʼime ya. Anyị nwere ala buru ibu nke ga-ezuru anyị na ha. Ha ga-alụ ụmụ nwanyị anyị, anyị ga-alụkwa ndị nke ha.
GEN 34:22 Ma ọ dị otu ihe ha chọrọ ka anyị mee tupu ha ekwere ibi nʼetiti anyị ka anyị na ha bụrụ otu ndị. Ọ bụ ibi ndị ikom anyị niile ugwu dịka e si bie ha ugwu.
GEN 34:23 Ọ bụrụ na unu chọrọ ka anụ ụlọ ha niile na akụ ha niile bụrụ nke anyị, ọ dị mma ka anyị kwenyere ha, ka ha binyere anyị.”
GEN 34:24 Ndị ikom niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ kwenyere nʼokwu Hamọ na nwa ya nwoke Shekem. E bikwara nwoke ọbụla nọ nʼobodo ahụ ugwu.
GEN 34:25 O ruo nʼụbọchị nke atọ, mgbe ọnya ugwu ha na-egbu ha mgbu, ụmụ ndị ikom Jekọb abụọ, Simiọn na Livayị, ụmụnne Daịna, jiri mma agha ha pụkwuru ndị bi nʼobodo ahụ na-atụghị anya na ihe dị otu a ga-eme, gbuo ndị ikom niile nọ nʼobodo ahụ.
GEN 34:26 Ha gbukwara Hamọ na Shekem nwa ya nwoke, kpọpụta Daịna site nʼụlọ Shekem, laghachi nʼụlọ ha.
GEN 34:27 Mgbe ahụ ụmụ ndị ikom Jekọb niile bịakwasịrị ndị a e gburu egbu, kwakọọ ihe niile dị nʼobodo ahụ niile, nʼihi mmerụ e merụrụ nwanne ha nwanyị.
GEN 34:28 Ha kwakọọrọ ngwongwo niile dị nʼobodo ahụ, kpụrụkwa anụ ụlọ niile, igwe ewu na atụrụ, igwe ehi na igwe ịnyịnya ibu niile, na ihe niile dị nʼime obodo ahụ, na ihe niile dị nʼubi ndị ahụ obodo nwere.
GEN 34:29 Akụ ha niile, na ndị inyom ha niile na ụmụntakịrị ha, na ihe niile dị nʼime ụlọ ha, ka ha weere dịka ihe a dọtara nʼagha.
GEN 34:30 Mgbe Jekọb hụrụ ihe ụmụ ya mere, ọ kpọrọ Simiọn na Livayị sị ha, “Unu ebuterela m nsogbu mee ka m bụrụ ihe na-esi isi ọjọọ nʼetiti ndị Kenan na ndị Periz nwe ala a. Ebe anyị dị ole na ole, ọ bụrụ na ha ejikọta onwe ha ọnụ lụso m agha, ha ga-ekpochapụ mụ na ezinaụlọ m.”
GEN 34:31 Ma ha zara sị ya, “O kwesiri ka o meso nwanne anyị nwanyị mmeso dịka ọ bụ akwụna?”
GEN 35:1 Chineke sịrị Jekọb, “Bilie, gaa Betel, birikwa nʼebe ahụ. Wuo ebe ịchụ aja nye Chineke, onye mere ka ị hụ ya mgbe ị na-agbanarị Ịsọ nwanne gị nwoke.”
GEN 35:2 Ya mere, Jekọb gwara ndị ezinaụlọ ya na ndị niile so ya sị, “Wezuganụ chi ndị ala ọzọ dị nʼetiti unu. Doonụ onwe unu ọcha, gbanweekwanụ uwe unu.
GEN 35:3 Bilienụ, ka anyị gaa Betel, ebe m ga-ewu ebe ịchụ aja nye Chineke, onye zara m oku nʼụbọchị nsogbu m, ma nọnyekwara m na njem nke m gara.”
GEN 35:4 Ya mere, ha nyere Jekọb chi ndị ala ọzọ niile ha ji nʼaka, na ọla niile dị ha na ntị. Jekọb chịịrị ha niile lie ha nʼokpuru osisi ook dị na Shekem.
GEN 35:5 Ha biliri ije. Egwu Chineke dakwasịrị obodo niile gbara ha gburugburu. Ọ dịghị ndị chụsoro ha.
GEN 35:6 Jekọb na ndị niile so ya rutere Luz, nke a na-akpọkwa Betel nke dị na Kenan.
GEN 35:7 Jekọb wuru ebe ịchụ aja nʼebe a, kpọọ aha ebe ahụ El Betel, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Chineke gosiri ya onwe ya mgbe ọ na-agbanarị Ịsọ nwanne ya nwoke.
GEN 35:8 Mgbe nke a gasịrị, Debọra, nwanyị lekọtara Ribeka mgbe ọ bụ nwantakịrị, nwụrụ. E liri ya nʼokpuru osisi ook dị na Betel. A kpọkwara ebe ahụ, “Osisi ook ebe ịkwa akwa.”
GEN 35:9 Chineke gosiri Jekọb onwe ya ọzọ, mgbe o sitere na Padan Aram pụta, gọziekwa ya.
GEN 35:10 Chineke sịrị ya, “Aha gị bụ Jekọb ma a gaghị akpọkwa gị Jekọb ọzọ, kama aha gị ga-abụ Izrel.” Ya mere ọ kpọrọ ya Izrel.
GEN 35:11 Chineke sịrị ya, “Abụ m Chineke onye pụrụ ime ihe niile. Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Otu mba na igwe mba ga-esi na gị pụta. Ndị eze ga-esitekwa gị nʼahụ pụta.
GEN 35:12 Ala ahụ m nyere Ebraham na Aịzik ka m na-enyekwa gị. Aga m enyekwa ya ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị.”
GEN 35:13 Emesịa, Chineke si nʼebe ahụ ha nọ kparịtaa ụka pụọ.
GEN 35:14 Jekọb wuru ogidi nkume nʼebe ahụ Chineke nọ gwa ya okwu. Ọ wụsara onyinye ihe ọṅụṅụ wụkwasịkwa mmanụ nʼelu ogidi nkume ahụ.
GEN 35:15 Jekọb kpọrọ ebe ahụ ya na Chineke nọ kparịtaa ụka Betel.
GEN 35:16 Ha biliri ije, site na Betel. Ma mgbe ha ka nọ ebe dị anya site nʼobodo Efrat, Rechel mụrụ nwa, ma o nwere ihe mgbu ka ọ na-amụ nwa.
GEN 35:17 Mgbe o sitere nʼoke ihe mgbu na-amụpụta nwa ahụ, nwanyị na-aghọ nwa gwara ya, “Atụla egwu, nʼihi na ọ bụ nwa nwoke ọzọ ka ị mụtara.”
GEN 35:18 Ma tupu Rechel ekuo ume ikpeazụ, nʼihi na ọ na-anwụ, ọ kpọrọ aha nwa ọhụrụ ahụ Ben-Oni, ma nna ya kpọrọ ya Benjamin.
GEN 35:19 Rechel nwụrụ, e lie ya nʼakụkụ ụzọ gara Efrat, nke a na-akpọkwa Betlehem.
GEN 35:20 Jekọb wuru ogidi nʼelu ili ya, nke na-eguzokwa ruo taa, igosi ebe e liri Rechel.
GEN 35:21 Izrel malitere ije ya, tutu ruo ebe o wuru ebe izuike ya nʼala dị nʼofe ọzọ nke Migdal Eda.
GEN 35:22 Mgbe Izrel bi nʼala ahụ, Ruben gara dinakwuru Bilha, iko nwanyị nna ya. E mekwara ka Izrel nụ ihe a Ruben mere. Ụmụ ndị ikom Jekọb dị iri na abụọ.
GEN 35:23 Ụmụ Lịa bụ, Ruben, ọkpara Jekọb. Simiọn, Livayị, Juda, Isaka na Zebụlọn.
GEN 35:24 Ụmụ Rechel bụ, Josef na Benjamin.
GEN 35:25 Ụmụ Bilha, odibo nwanyị Rechel bụ, Dan na Naftalị.
GEN 35:26 Ụmụ Zilpa, odibo nwanyị Lịa bụ, Gad na Asha. Ụmụ ndị ikom ndị a ka a mụụrụ Jekọb na Padan Aram.
GEN 35:27 Nʼikpeazụ, Jekọb bịakwutere nna ya Aịzik na Mamre nke dị nso na Kiriat Arba (ebe a na-akpọ Hebrọn). Ebe ahụ ka Ebraham na Aịzik biri na mbụ.
GEN 35:28 Nʼoge ahụ Aịzik gbara narị afọ na iri afọ asatọ.
GEN 35:29 Ọ dịkwaghị anya site nʼoge a, Aịzik nwụrụ, mgbe o mere nnọọ agadi. Ụmụ ya ndị ikom abụọ, Ịsọ na Jekọb, liri ya.
GEN 36:1 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, onye a na-akpọ Edọm.
GEN 36:2 Ịsọ lụrụ ndị inyom a site nʼala Kenan. Onye nke mbụ bụ Ada nwa Elọn, onye Het. Nke abụọ bụ Oholibama, nwa Ana, nwa nwa Zibiọn, onye Hiv.
GEN 36:3 Onye nke atọ bụ Basemat, nwa Ishmel, onye nwanne ya nwanyị bụ Nebaiot.
GEN 36:4 Ada mụụrụ Ịsọ Elifaz, ebe Basemat mụrụ Reuel.
GEN 36:5 Oholibama mụtaara Jeush na Jalam na Kora. Ndị a bụ ụmụ Ịsọ ndị a mụtara ya nʼala Kenan.
GEN 36:6 Emesịa, Ịsọ duuru ndị nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya. Ọ chịkọọrọ anụ ụlọ ya niile, na akụ niile ọ kpatara nʼala Kenan kwapụ gaa biri nʼala dị anya site nʼebe nwanne ya Jekọb nọ.
GEN 36:7 Ebe ọ bụ na akụnụba ha nwere dịkarịrị ukwuu ha ibikọta ọnụ, tinyekwara na ala ebe ha bi enwezighị ike ibuli ha nʼihi anụ ụlọ niile ha nwere.
GEN 36:8 Ya mere, Ịsọ gara biri nʼala ugwu ugwu Sia, Ịsọ bụkwa Edọm.
GEN 36:9 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, nna obodo Edọm, nʼala ugwu ugwu Sia.
GEN 36:10 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ịsọ mụtara. Elifaz bụ ọkpara Ada, nwunye Ịsọ. Nwanne ya bụ Reuel, nwa Basemat, nwunye Ịsọ.
GEN 36:11 Ụmụ Elifaz ndị ikom bụ, Teman, Ọmaa, Zefo, Gatam na Kenaz.
GEN 36:12 Elifaz nwa Ịsọ nwere iko nwanyị aha ya bụ Timna, onye mụtaara ya Amalek. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ada, nwunye Ịsọ.
GEN 36:13 Ụmụ ndị ikom Reuel bụ, Nahat, Zera, Shama na Miza. Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Basemat, nwunye Ịsọ.
GEN 36:14 Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ. Oholibama bụ nwa Ana na nwa nwa Zibiọn. Ọ mụtaara Ịsọ Jeush, Jalam na Kora.
GEN 36:15 Ndị a bụ ọnụmara si nʼetiti ụmụ ụmụ Ịsọ. Site nʼetiti ụmụ Elifaz, ọkpara Ịsọ, e nwere Ọnụmara Teman, ọnụmara Ọmaa, ọnụmara Zefo, ọnụmara Kenaz.
GEN 36:16 Ọnụmara Kora, ọnụmara Gatam na ọnụmara Amalek. Ndị eze ndị a bụ ụmụ Elifaz nʼala Edọm. Ha bụ ụmụ ụmụ Ada.
GEN 36:17 Ndị bụ ụmụ Reuel, nwa Ịsọ, e nwere ọnụmara Nahat, ọnụmara Zera, ọnụmara Shama, ọnụmara Miza. Ọnụmara ndị a bụ ụmụ Reuel nʼala Edọm. Ha bụ ụmụ Basemat, nwunye Ịsọ.
GEN 36:18 Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ, ọnụmara Jeush, ọnụmara Jalam, na ọnụmara Kora. Ndị a bụ ọnụmara ụmụ Oholibama nwa Ana, nwunye Ịsọ.
GEN 36:19 Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ịsọ (ya bụ, Edọm). Ndị a bụkwa ọnụmara ha.
GEN 36:20 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Sia onye Hor, ndị bi nʼakụkụ ala ahụ: Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana,
GEN 36:21 Dishọn, Eza na Dishan. Ụmụ ndị ikom Sia nʼala Edọm, ha bụ ndị ọnụmara Hor.
GEN 36:22 Ụmụ ndị ikom Lotan bụ, Hori na Homam. Timna bụkwa nwanne nwanyị Lotan.
GEN 36:23 Ụmụ ndị ikom Shobal bụ, Alvan, Manahat, Ebal, Shefo na Onam.
GEN 36:24 Ụmụ ndị ikom Zibiọn mụrụ bụ Aịa na Ana. Ana bụ nwoke ahụ chọpụtara isi iyi mmiri ime ala ahụ nke mmiri dị ọkụ si nʼime ya na-asọpụta nʼọzara, mgbe ọ na-elekọta ịnyịnya ibu nna ya Zibiọn.
GEN 36:25 Ụmụ Ana bụ, Dishọn na Oholibama nwa nwanyị Ana.
GEN 36:26 Ụmụ ndị ikom Dishọn bụ, Hemdan na Eshban na Itran na Keran.
GEN 36:27 Ụmụ ndị ikom Eza bụ, Bilhan na Zaavan na Akan.
GEN 36:28 Ụmụ ndị ikom Dishan bụ, Uz na Aran.
GEN 36:29 Ndị a bụ ndị ọnụmara Hor, ọnụmara Lotan, ọnụmara Shobal, ọnụmara Zibiọn, ọnụmara Ana,
GEN 36:30 ọnụmara Dishọn, ọnụmara Eza na ọnụmara Dishan. Ndị a niile bụ ndị ọnụmara Hor dịka nkewa ha si dị nʼala Sia.
GEN 36:31 Ndị a bụ ndị eze chịrị nʼEdọm tupu ndị Izrel enwee eze mbụ ha.
GEN 36:32 Bela, nwa Beoa chịrị dịka eze nʼEdọm. Isi obodo ya bụ Dinhaba.
GEN 36:33 Mgbe Bela nwụrụ, Jobab nwa Zera onye Bozra nọchiri ya dịka eze.
GEN 36:34 Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye si nʼala Teman nọchiri ya dịka eze.
GEN 36:35 Mgbe Husham nwụrụ, Hadad nwa Bedad, onye meriri ndị Midia nʼagha nʼala Moab nọchiri dịka eze. Isi obodo ya bụ Avit.
GEN 36:36 Mgbe Hadad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya dịka eze.
GEN 36:37 Mgbe Samla nwụrụ, Shaul onye sitere na Rehobọt dị nʼakụkụ osimiri nọchiri ya dịka eze.
GEN 36:38 Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-Hanan nwa Akboa nọchiri ya dịka eze.
GEN 36:39 Mgbe Baal-Hanan nwa Akboa nwụrụ, Heda nọchiri ya dịka eze. Aha obodo ya bụ Pau. Aha nwunye ya bụ Mehetabel, nwa Matred nwa nwa Mezahab.
GEN 36:40 Ndị a bụ ndịisi ọnụmara Ịsọ, dịka aha ha si dị, dịka ikwu ha na akụkụ ebe ha bi si dị: Timna, Alva, Jetet,
GEN 36:41 Oholibama, Elaa, Pinon,
GEN 36:42 Kenaz, Teman, Mibza,
GEN 36:43 Magdiel na Iram. Ndị a bụ ndịisi ọnụmara nʼEdọm, dịka ebe obibi ha na ala obi ha si dị. Nke a bụ ezinaụlọ Ịsọ bụkwa nna ndị Edọm.
GEN 37:1 Jekọb bigidere nʼala Kenan, ala ahụ nna ya buru ụzọ biri nʼime ya.
GEN 37:2 Nke a bụ usoro akụkọ banyere ezinaụlọ Jekọb. Josef, onye gbarala afọ iri na asaa, na-esonyere ụmụnne ya ndị ikom na-azụ igwe anụ ụlọ, ya onwe ya bụ naanị nwantakịrị na-enyere ụmụ Bilha na ụmụ Zilpa ndị nwunye nna ya aka. Ma Josef na-ewetara nna ha akụkọ maka ihe ọjọọ ha na-eme.
GEN 37:3 Ma Izrel hụrụ Josef nʼanya karịa ụmụ ya ndị ikom ndị ọzọ niile nʼihi na Josef bụ nwa a mụụrụ ya nʼoge agadi ya. Ọ kwaara ya uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa.
GEN 37:4 Mgbe ụmụnne ya chọpụtara na nna ha hụrụ ya nʼanya karịa onye ọbụla nʼime ha, ha kpọrọ ya asị, ha adịghị agwakwa ya okwu ọma.
GEN 37:5 Otu oge, Josef rọrọ nrọ, mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya nrọ a ọ rọrọ, ha kpọrọ ya asị karịa.
GEN 37:6 Ọ gwara ha, “Geenụ ntị na nrọ a m rọrọ.
GEN 37:7 Anyị niile nọ nʼubi na-achịkọta ọka, ngwangwa ukwu ọka nke m biliri guzoro ọtọ, ebe ukwu ọka nke unu niile gbara ukwu ọka nke m gburugburu, na-akpọ isiala nye ya.”
GEN 37:8 Ụmụnne ya jụrụ ya, “Ị na-akọwa na ọ bụ gị ga-abụ eze anyị? Na ọ bụ gị nʼezie ga-achị anyị?” Ha kpọrọ ya asị karịa nʼihi nrọ ya na okwu ya niile.
GEN 37:9 Josef rọkwara nrọ ọzọ, kọkwara ụmụnne ya. Ọ sịrị, “Geenụ ntị, arọrọ m nrọ ọzọ. Ma na nrọ nke ugbu a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu na-akpọ isiala nye m.”
GEN 37:10 Ma mgbe ọ kọọrọ nna ya na ụmụnne ya nrọ a. Nna ya baara ya mba, sị, “Nrọ nke a ị rọrọ bụ nrọ gịnị? Ọ bụ ezie na anyị niile, mụ onwe m na nne gị na ụmụnne gị, ga-abịa na-akpọrọ gị isiala?”
GEN 37:11 Ụmụnne ya kwosiri ya ekworo nʼihi ya, ma nna ya debere ihe ndị a niile nʼobi ya.
GEN 37:12 Ka ọ dị, ụmụnne ya gara ilekọta igwe anụ ụlọ nna ha na Shekem.
GEN 37:13 Izrel sịrị Josef, “Dịka ị maara, ụmụnne gị nọ na-eche anụ ụlọ na Shekem. Bịa, aga m eziga gị nʼebe ahụ.” Josef zara sị, “Ọ dị mma.”
GEN 37:14 Ya mere, ọ gwara ya, “Gaa ka ị chọpụta ma ihe ọ na-agazikwara ụmụnne gị na igwe anụ ụlọ ndị ahụ nke ọma, ma weghachiri m ozi.” O sitere na Ndagwurugwu Hebrọn zipụ ya. Ọ bịaruru Shekem,
GEN 37:15 ma otu nwoke hụrụ ya ka ọ na-awagharị gburugburu nʼọhịa dị nʼebe ahụ, ọ jụrụ ya, “Gịnị ka ị na-achọ?”
GEN 37:16 Ọ sịrị, “Ana m achọ ụmụnne m. Biko, ị nwere ike ịgwa m ebe ha nọ na-azụ igwe anụ ụlọ ha?”
GEN 37:17 Nwoke ahụ zara sị, “Ha esitela nʼebe a pụọ. Anụrụ m ka ha na-asị, ‘Ka anyị gaa Dọtan.’ ” Ya mere, Josef gawara Dọtan ịchọ ụmụnne ya. Ọ hụkwara ha nʼebe dị nso na Dọtan.
GEN 37:18 Ma ha lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya.
GEN 37:19 Ha sịrịtara onwe ha, “Lee eze nrọ ahụ ka ọ na-abịa!
GEN 37:20 Ugbu a, bịanụ, ka anyị gbuo ya, tụba ya nʼime otu olulu ndị a. Anyị ga-asịkwa na anụ ọhịa eriela ya. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụkwa ihe nrọ ya niile ga-abụ.”
GEN 37:21 Ruben nụrụ ihe a, ma napụtakwa ya site nʼaka ha. Ọ sịrị, “Ka anyị hapụ igbu ya.”
GEN 37:22 Ruben sịrị ha, “Ka unu hapụ ịkwafu ọbara. Kama tụnyenụ ya nʼime olulu a dị nʼọzara. Ma unu akpatụkwala ya aka.” Ma nzube ya bụ ịnapụta ya site nʼaka ha, dulaara ya nna ya.
GEN 37:23 Ya mere, mgbe Josef bịakwutere ụmụnne ya, ha yipụrụ ya uwe mwụda ya, uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa o yi nʼahụ.
GEN 37:24 Ha duru ya tụnye ya nʼime olulu. Ọ bụ olulu tọgbọrọ nʼefu, nke mmiri na-adịghị nʼime ya.
GEN 37:25 Mgbe ha nọdụrụ ala bido iri nri, ha leliri anya ha hụ igwe ndị ahịa Ishmel si Gilead. Ịnyịnya kamel ha bu ụda na mgbaa na máá. Ọ bụkwa Ijipt ka ha bu ihe ndị a na-aga.
GEN 37:26 Mgbe ahụ, Juda jụrụ ụmụnne ya, “Uru gịnị ka ọ ga-abara anyị igbu nwanne anyị, ma kpuchie ọbara ya?
GEN 37:27 Bịanụ, ka anyị resi ya ndị Ishmel ndị a, ka aka anyị ghara nʼimetụ ya, nʼihi na nwanne anyị na otu anụ ahụ anyị ka ọ bụ.” Ụmụnne ya gere ya ntị.
GEN 37:28 Mgbe ndị ahịa Midia ahụ rutere, ha sitere nʼolulu dọpụta Josef resi ya ndị Ishmel ahụ, ndị kwụrụ ụmụnne Josef iri mkpụrụ shekel ọlaọcha abụọ. Ha duuru Josef gaa Ijipt.
GEN 37:29 Ruben mechara lọghachi gaa nʼolulu ahụ, ma ka ọ na-ahụghị Josef nʼime olulu a, ọ dọwara uwe ya.
GEN 37:30 O jekwuru ụmụnne ya sị ha, “Nwata ahụ anọkwaghị ebe ahụ! Mụ onwe m, olee ebe m ga-ala?”
GEN 37:31 Ụmụnne ya gburu otu ewu were uwe Josef bịanye nʼime ọbara ya.
GEN 37:32 Ha chịịrị uwe mwụda ahụ nwere ọtụtụ agwa jekwuru nna ha sị ya, “Anyị hụrụ uwe a nʼime ọhịa. Leruo ya anya ka ị mara maọbụ uwe mwụda nwa gị.”
GEN 37:33 Ọ matara na ọ bụ ya, sị, “E, nke a bụ uwe nwa m nwoke. Ajọ anụ eriela ya. Anụ ọhịa adọkasịala Josef nʼezie.”
GEN 37:34 Mgbe ahụ, Jekọb dọwara uwe ya, yiri akwa mkpe, ruo ụjụ ọtụtụ ụbọchị nʼihi nwa ya.
GEN 37:35 Ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile bịara ịkasị ya obi, ma ọ jụrụ ịnabata nkasiobi ọbụla. Ọ sịrị, “Aga m alakwuru nwa m nʼala mmụọ site nʼiru ụjụ.” Nna ya kwagidere akwa nʼihi ya.
GEN 37:36 Ugbu a, ndị Midia ahụ rere Josef nʼIjipt, resi ya Pọtifa, otu nʼime ndịisi na-ejere Fero ozi, onye bụ onyeisi ndị nche Fero, bụ eze Ijipt.
GEN 38:1 Nʼoge ahụ, Juda hapụrụ ụmụnne ya gaa binyere otu nwoke onye Adulam a na-akpọ Hira.
GEN 38:2 Nʼebe ahụ, Juda hụrụ otu nwaagbọghọ, nwa otu nwoke onye Kenan, aha ya bụ Shua. Ọ lụrụ ya ma bakwuru ya.
GEN 38:3 Ọ tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye Juda gụrụ aha Ịa
GEN 38:4 Nwunye ya dịkwara ime ọzọ mụta nwa nwoke nke ya bụ nwunye ya gụrụ Onan.
GEN 38:5 Ọ mụkwara nwa nwoke ọzọ, onye ọ kpọrọ Shela. Ọ bụ na Kezib ka ọ mụrụ ya.
GEN 38:6 Juda lụtaara Ịa, ọkpara ya, nwunye onye aha ya bụ Tama.
GEN 38:7 Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Onyenwe anyị gburu ya.
GEN 38:8 Mgbe ahụ, Juda sịrị Onan, “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.”
GEN 38:9 Onan ma na mkpụrụ a agaghị abụ nke ya. Nʼihi ya, mgbe ọbụla ọ bakwuru nwunye nwanne ya, ọ na-anyụsa mkpụrụ nwa ya nʼala, ime ka ọ ghara inye nwanne ya nwoke nwa.
GEN 38:10 Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼihi ya Onyenwe anyị gbukwara ya.
GEN 38:11 Juda sịrị nwunye nwa ya, bụ Tama, “Laa nʼụlọ nna gị nọrọ dịka nwanyị di ya nwụrụ tutu Shela nwa m nwoke etoo.” Ma echiche ya bụ, “ka ọ ghara ịnwụ dịka ụmụnne ya.” Tama lara gaa biri nʼụlọ nna ya.
GEN 38:12 Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye Juda nwa Shua nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere Timna, ya na enyi ya Hira, onye Adulam, ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị.
GEN 38:13 A gwara Tama sị ya, “Nna di gị na-aga Timna ịkpacha atụrụ ya ajị.”
GEN 38:14 O yipụrụ uwe mkpe ya, were akwa mkpuchi kpuchie onwe ya gaa nọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama Enayim, nke dị nʼụzọ e si aga Timna. O mere otu a nʼihi na ọ matara na Shela etoola, ma enyeghị ya ka ọ bụrụ nwunye ya.
GEN 38:15 Mgbe Juda hụrụ ya, o chere na ọ bụ otu nwanyị akwụna, ebe ọ bụ na o kpuchiri ihu ya.
GEN 38:16 Ma ebe ọ mataghị na ọ bụ nwunye nwa ya, o jekwuru ya ebe ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ sị ya, “Bịa, kwere ka mụ na gị dinaa.” Tama jụrụ, “Gịnị ka ị ga-enye m ma ọ bụrụ na m kwere ka mụ na gị dinaa?”
GEN 38:17 Ọ zara, “Aga m ezitere gị otu nwa ewu site nʼigwe ewu na atụrụ m.” Ọ jụrụ, “Ị ga-enye m ihe akaebe ruo mgbe ị ga-ezite ya?”
GEN 38:18 Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?” Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime.
GEN 38:19 Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya.
GEN 38:20 Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya.
GEN 38:21 Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama Enayim?” Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.”
GEN 38:22 Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’ ”
GEN 38:23 Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.”
GEN 38:24 Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.” Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.”
GEN 38:25 Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.”
GEN 38:26 Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ.
GEN 38:27 Mgbe oge ọmụmụ nwa ya ruru, ejima ka ahụrụ nʼakpanwa ya.
GEN 38:28 Mgbe ọ na-amụ ha, otu nʼime ha sepụtara aka ya. Nwanyị na-aghọ nwa weere eriri na-acha uhie uhie kee ya na nkwoji aka kwuo sị, “Ọ bụ nke a bụ ụzọ pụta.”
GEN 38:29 Ma nwa ahụ mesịrị sekpuo aka ya, nwanne ya nke ọzọ eburu ya ụzọ pụta. Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ otu a ka ị si tikapụta?” A kpọrọ ya Perez.
GEN 38:30 Emesịa, nwanne ya, nke bu eriri uhie uhie ahụ na nkwoji aka pụtakwara. A kpọrọ ya Zera.
GEN 39:1 A kpọọrọ Josef gaa nʼala Ijipt. Pọtifa, bụ nwoke Ijipt, otu nʼime ndịisi na-ejere Fero ozi, na onyeisi ndị agha na-eche nche zụụrụ ya site nʼaka ndị Ishmel, bụ ndị duuru ya gaa nʼebe ahụ.
GEN 39:2 Onyenwe anyị nọnyeere Josef, nke mere na ihe gaara ya nke ọma nʼụlọ nna ya ukwu onye Ijipt.
GEN 39:3 Nna ya ukwu hụrụ na Onyenwe anyị nọnyeere Josef, hụkwa na Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile o mere gaara ya nke ọma.
GEN 39:4 Josef hụtara amara nʼihu ya, ghọọ onyeozi nke aka ya. Pọtifa mere ya onye na-elekọta ezinaụlọ ya. Nyefee ya ihe niile o nwere ka ọ bụrụ onye na-elekọta ha.
GEN 39:5 Site nʼoge a, o mere ka ọ bụrụ onye na-elekọta ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere, Onyenwe anyị gọziri ezinaụlọ onye Ijipt ahụ nʼihi Josef. Ngọzị Onyenwe anyị dịkwasịrị nʼihe niile Pọtifa nwere, ma ihe o nwere nʼụlọ ma ndị o nwere nʼubi ya.
GEN 39:6 Ya mere, ọ hapụrụ ihe niile o nwere nʼaka Josef. Nke a mere na ọ mazighị ihe ọzọ na-eme, ma ọ bụghị nri nke ọ na-eri. Josef nʼonwe ya mara mma ahụ dịkwa mma ile anya.
GEN 39:7 Mgbe oge nta gasịrị, nwunye Pọtifa lere Josef anya sị ya, “Bịa ka anyị abụọ dinaa.”
GEN 39:8 Ma Josef jụrụ. Ọ gwara nwunye nna ya ukwu sị, “Lee, nna m ukwu anaghị echegbu onwe ya banyere ihe ọbụla nʼụlọ a. O werela ihe niile o nwere nyefee m nʼaka ka m lekọta ha anya.
GEN 39:9 O nweghị onye ọnọdụ ya dị elu karịa nke m nʼụlọ a. O gbochighị m ihe ọbụla ma ọ bụghị gị, nʼihi na ị bụ nwunye ya. Olee otu m ga-esi mee oke ihe ọjọọ dị otu a, mee mmehie megide Chineke.”
GEN 39:10 Ọ bụ ezie na nwanyị a nọgidere na-enye Josef nsogbu site nʼụbọchị ruo ụbọchị ma Josef jụrụ iso ya dinaa, jụkwa ịnọnyere ya.
GEN 39:11 Otu ụbọchị, Josef batara nʼime ụlọ ịrụ ọrụ ya. O nweghị ndị ọzọ na-eje ozi nọ nʼime ụlọ nʼụbọchị ahụ.
GEN 39:12 Nwunye Pọtifa jidere Josef nʼuwe mwụda ya, rịọọ ya sị ya, “Bịa ka anyị dinaa.” Ma Josef si nʼime ụlọ ahụ gbapụ, hapụ uwe mwụda ya nʼaka nwunye Pọtifa.
GEN 39:13 Mgbe nwanyị a hụrụ na Josef agbapụla, hapụ uwe ya,
GEN 39:14 ọ kpọrọ ndị na-eje ozi nʼezinaụlọ ya sị ha, “Lee, onye Hibru a di m kpọbatara nʼụlọ a chọrọ iji anyị gwurie egwu. Ọ bịakwutere m nʼime ụlọ chọọ ka mụ na ya dinaa. E tiri m mkpu nʼolu ike.
GEN 39:15 Mgbe ọ nụrụ ka m welitere olu m tie mkpu enyemaka m tiri, o sitere nʼime ụlọ a gbapụ, ma hapụrụ m uwe ya.”
GEN 39:16 Nwanyị a debere uwe ahụ nʼakụkụ ya ruo mgbe nna ya ukwu lọtara nʼụlọ.
GEN 39:17 Mgbe ahụ, ọ gwara di ya okwu ndị a sị, “Onye ohu Hibru a ị kpọbataara anyị bakwutere m iji m gwurie egwu.
GEN 39:18 Ma mgbe m welitere olu tie mkpu enyemaka o sitere nʼụlọ gbapụ hapụrụ m uwe ya.”
GEN 39:19 Mgbe nna ya ukwu nụrụ ihe nwunye ya gwara ya sị, “Otu a ka ohu gị si meso m mmeso,” o were iwe dị ọkụ.
GEN 39:20 Nna ukwu Josef weere ya tụnye nʼụlọ mkpọrọ, nʼebe a na-etinye ndị mkpọrọ eze Ijipt. Ma ebe ahụ Josef nọ nʼụlọ mkpọrọ,
GEN 39:21 Onyenwe anyị nọnyeere ya. O meere ya ebere, mekwa ka o nweta ihuọma nʼebe onyeisi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ nọ.
GEN 39:22 Onyeisi ndị na-eche ụlọ mkpọrọ mere Josef onyeisi ndị mkpọrọ niile nọ nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Josef ghọrọ onye a na-ajụ otu ihe si aga nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ.
GEN 39:23 Onyeisi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ enyeghịkwa onwe ya nsogbu maka ihe ọbụla. Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere Josef, mee ka ihe ọbụla ọ na-eme gaa nke ọma.
GEN 40:1 Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ eze Ijipt na onye na-esiri ya nri mehiere megide nna ha ukwu, eze Ijipt.
GEN 40:2 Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri.
GEN 40:3 O tinyere ha na nga, nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ onyeisi ndị nche, ebe ahụ a tụbara Josef.
GEN 40:4 Onyeisi ndị nche mere Josef onye na-elekọta ha. Ha nọrọ nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ ụbọchị.
GEN 40:5 Ha abụọ, onye ahụ na-esiri eze nri, na onye na-ebu iko eze Ijipt, rọrọ nrọ nʼotu abalị. Nrọ nke onye ọ bụla nwere nkọwa nke ya.
GEN 40:6 Mgbe chi bọrọ, Josef bịakwutere ha hụ na ihu ha gbarụrụ agbarụ.
GEN 40:7 Nʼihi ya, ọ jụrụ ndị ozi Fero ndị a ha na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ nna ya ukwu sị ha, “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?”
GEN 40:8 Ha zara sị ya, “Anyị rọrọ nrọ ọjọọ, ma onye nkọwa ya adịghị.” Josef sịrị ha, “Ọ bụghị Chineke nwee ike ịkọwa nrọ? Kọọrọnụ m ha.”
GEN 40:9 Onyeisi ndị na-ebu iko kọọrọ Josef nrọ ya. Ọ sịrị ya, “Arọrọ m nrọ hụ osisi vaịnị nʼihu m.
GEN 40:10 Osisi vaịnị a nwere alaka atọ. Mgbe m nọ na-ele anya, osisi vaịnị ahụ mara ifuru, mịpụta mkpụrụ nʼụyọkọ nʼụyọkọ, ha chakwaa.
GEN 40:11 Ebe ọ bụ nʼiko Fero dị m nʼaka, a ghọọrọ m mkpụrụ vaịnị ndị a, pịpụta mmiri ha pịnye nʼime iko mmanya Fero, bunye ya ka ọ ṅụọ.”
GEN 40:12 Josef sịrị ya, “Nke a bụ ihe nrọ gị pụtara. Alaka atọ ahụ bụ abalị atọ.
GEN 40:13 Nʼime abalị atọ Fero ga-akpọpụta gị, mee ka i nwere onwe gị. Fero ga-enyeghachikwa gị ọrụ gị. Ị ga-etinyekwa Fero iko ya nʼaka dịka i si eme na mbụ mgbe ị bụ onye na-ebu iko ya.
GEN 40:14 Mgbe ihe gaara gị nke ọma, chetakwa m, ma gosi m obiọma, gwara m Fero ka o si nʼụlọ mkpọrọ a wepụta m.
GEN 40:15 Ọ bụ ntọrọ ka atọọrọ m site nʼala ndị Hibru. Nʼotu aka ahụ, nʼebe a ọ dịkwaghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere nke kwesiri ka atụnye m nʼụlọ mkpọrọ a.”
GEN 40:16 Mgbe onyeisi ndị na-esiri Fero nri hụrụ na nkọwa nrọ ahụ dị mma, ọ sịrị Josef, “Mụ onwe m, na nrọ m nke m, ebu m nkata achịcha atọ nʼisi.
GEN 40:17 Nkata nke dị nʼelu jupụtara na achịcha dị iche iche e gheere eze, bụ Fero. Ma ụmụ nnụnụ bịara na-eri achịcha ndị ahụ dị na nkata m bụ nʼisi.”
GEN 40:18 Josef zara sị ya, “Lee ihe nrọ gị pụtara. Nkata atọ ahụ bụ abalị atọ.
GEN 40:19 Nʼime abalị atọ ka Fero ga-esi nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta gị, nye iwu ka e bepụ gị isi, kwụba gị nʼelu osisi. Ụmụ nnụnụ ga-erichapụ anụ ahụ gị.”
GEN 40:20 Nʼabalị nke atọ, site nʼụbọchị ndị a rọrọ nrọ ha, Fero mere mmemme ncheta ọmụmụ ya. Ọ kpọrọ ndị niile na-ejere ya ozi oriri. O ziri ozi ka a gaa nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta onyeisi ndị na-ebunye ya iko ihe ọṅụṅụ na onyeisi ndị na-esiri ya nri.
GEN 40:21 O nyeghachiri onyeisi ndị na-ebu iko ya ọrụ ya, weghachi ya nʼọnọdụ ya. Nwoke a bunyekwara Fero iko ya dịka o si eme na mbụ.
GEN 40:22 Ma ọ kwụgburu onyeisi ndị na-esiri ya nri, dịka Josef si kọwaa nrọ ha.
GEN 40:23 Ma onyeisi ndị ahụ na-ebu iko eze echetaghị Josef. O chefuru ya.
GEN 41:1 O ruo mgbe afọ abụọ gasịrị, Fero rọrọ nrọ hụ onwe ya ka o guzo nʼakụkụ mmiri Naịl.
GEN 41:2 Nʼebe ahụ, ọ hụrụ ehi asaa ndị si nʼosimiri Naịl na-apụta. Ehi ndị a buru ibu, maa mma. Ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ. Ha pụtara, bido ịta nri nʼetiti ahịhịa riidi.
GEN 41:3 Nʼatụfughị oge, ehi asaa ọzọ soro ha nʼazụ sikwa nʼosimiri Naịl na-apụta. Ma ehi ndị a tara ahụ nke ukwuu. Ha bụ nnọọ ọkpụkpụ ọkpụkpụ, jọọ njọ ile anya. Ha bịara guzo nʼakụkụ ehi ndị ahụ buru ibu.
GEN 41:4 Mgbe ahụ, ehi ndị a bụ naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ bịara richapụ ehi ndị ahụ buru ibu. Mgbe nke a mere Fero kwolitere.
GEN 41:5 Emesịa, Fero rahụkwara ụra ọzọ, rọọ nrọ nke ugboro abụọ, hụ ogbe ọka asaa ndị mịrị nʼotu ukwu ọka. Ogbe ọka ndị a buru ibu maa ezi mma.
GEN 41:6 Emesịa, ọ hụkwara ogbe ọka asaa ọzọ ka ha mịkwara nʼotu ukwu ọka ahụ. Ma ndị a ọ hụrụ kpọnwụsịrị akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ. Ọ bụ ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha kpọnwụọ.
GEN 41:7 Ogbe ọka ndị a fịkpọrọ afịkpọ loro ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu. Fero kwolitere hụ na ihe ndị a bụ nrọ.
GEN 41:8 Mgbe chi bọrọ, o nweghị udo na mmụọ ya. O ziri ozi kpọkọta ndị majiki niile, na ndị ọkachamara niile nke Ijipt. Fero kọọrọ ha ihe ọ rọrọ na nrọ. Ma ọ dịghị onye nwere ike ịkọwara ya ihe nrọ ya pụtara.
GEN 41:9 Ma nʼoge ahụ, onyeisi ndị na-ebu iko jekwuuru Fero gwa ya sị, “Taa ka m chetara mmehie m.
GEN 41:10 Oge ahụ Fero were iwe megide ndị na-ejere ya ozi, o tinyere mụ na onyeisi ndị na-esi nri nʼụlọ mkpọrọ nke dị nʼebe onyeisi ndị nche eze bi.
GEN 41:11 Onye ọbụla nʼime anyị abụọ rọrọ nrọ nʼotu abalị, nrọ ọbụla nwekwara nkọwa nke ya.
GEN 41:12 O nwere nwokorobịa onye Hibru anyị na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Ọ bụ ohu onyeisi ndị nche eze. Anyị kọọrọ ya nrọ anyị rọrọ. Ọ kọwakwaara anyị ihe nrọ anyị pụtara nye onye ọbụla nkọwa nke nrọ ya.
GEN 41:13 Ihe niile mere dịka o si kọwara anyị. E nyeghachiri m ọnọdụ m, ma kwụba onye nke ọzọ nʼosisi.”
GEN 41:14 Ya mere Fero ziri ozi ka a kpọọ Josef. E mere ngwangwa wepụta ya site nʼụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ọ kpụchara afụọnụ ya, gbanwee uwe ya, ọ bịakwara nʼihu Fero.
GEN 41:15 Fero gwara Josef sị, “Arọrọ m nrọ ma o nweghị onye ọbụla nwere ike ịkọwara m ihe nrọ m rọrọ pụtara. Ma anụla m na a kọọrọ gị nrọ a rọrọ, i nwere ike ịkọwa ihe nrọ ahụ pụtara.”
GEN 41:16 Josef zara sị ya, “Enweghị m ike ịkọwa nrọ nʼike aka m. Ma Chineke ga-enye Fero ọsịsa udo dịka ọ chọrọ.”
GEN 41:17 Mgbe ahụ, Fero malitere ịkọwara Josef nrọ ya. O kwuru sị, “Eguzoro m nʼakụkụ osimiri Naịl na nrọ m.
GEN 41:18 Mgbe ahụ, ahụrụ m ehi asaa si na mmiri ahụ pụta. Ehi ndị a mara abụba, ma gbaa agba. Ha bidokwara ịta nri nʼetiti ahịhịa riidi.
GEN 41:19 Emesịa, a hụrụ m ehi asaa ọzọ ka ha sikwa nʼosimiri ahụ pụta. Ehi ndị a ejighị ahụ. Ha bụ ọkpụkpụ ọkpụkpụ, jọọ njọ ile anya. Nʼezie, ahụtụbeghị m ụdị ehi dị otu a nʼala Ijipt niile.
GEN 41:20 Ehi asaa ndị a jọrọ njọ riri ehi ndị ahụ buru ibu, bụ ndị bu ha ụzọ si nʼosimiri ahụ pụta.
GEN 41:21 Ma mgbe ha risiri ehi ndị a, nri ahụ emeghị ka ụdịdị ha gbanwee. Ha dịkwa otu ha dị. Mgbe m hụsịrị ihe a, etetara m nʼụra.
GEN 41:22 “Mgbe m rọrọ nrọ ọzọ, a hụrụ m ogbe ọka asaa nke mịrị nʼotu ukwu ọka. Ọka asaa ndị a buru ibu, dị mma ile anya.
GEN 41:23 Ogbe ọka asaa ọzọ mịkwara nʼelu ukwu ọka ahụ, ma ndị a kpọnwụrụ akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ nʼihi nʼikuku si nʼọwụwa anyanwụ chakpọrọ ha.
GEN 41:24 Ma ọka ndị a fịkpọrọ afịkpọ lodara ọka asaa ndị ahụ mara mma. Akọọlara m ndị majiki ihe ndị a, ma ọ dịghị onye nʼime ha nwere ike ịkọwara m ihe nrọ ndị a pụtara.”
GEN 41:25 Mgbe ahụ, Josef sịrị Fero, “Nrọ abụọ Fero rọrọ pụtara otu ihe. Chineke esitela na nrọ ndị a gwa Fero ihe ọ na-aga ime.
GEN 41:26 Ehi asaa ndị ahụ buru ibu bụ afọ asaa. Ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu bụkwa afọ asaa. Ọ bụ otu nrọ ahụ, ọ bụ ezie na ị rọrọ ya ugboro abụọ.
GEN 41:27 Ehi asaa ndị ọzọ ahụ dị ọkpụkpụ ọkpụkpụ ndị pụtara mgbe ndị nke mbụ pụtachara bụ afọ asaa. Otu a kwa ogbe ọka ndị ọzọ fịkpọrọ afịkpọ nke ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha fịkpọọ bụ afọ asaa. Ha na-egosi afọ asaa mgbe oke ụnwụ ga-adị.
GEN 41:28 “Dịka m gwara Fero na mbụ, Chineke egosila gị ihe ọ chọrọ ime.
GEN 41:29 Afọ asaa na-abịa ga-abụ afọ asaa mgbe nri ga-adị ukwuu nʼala Ijipt niile.
GEN 41:30 Emesịa afọ asaa oke ụnwụ ga-eso ha. Mgbe ahụ, a ga-echefu ụba niile nke ala Ijipt. Ụnwụ a ga-ala obodo nʼiyi.
GEN 41:31 Agaghị echetakwa na e nwere oge ịba ụba ihe oriri nʼala a, nʼihi oke ụnwụ ahụ nke ga-eso ya ga-adị oke ukwuu.
GEN 41:32 Ihe mere Fero ji rọọ nrọ a ugboro abụọ bụ nʼihi na Chineke ekpebiela na ihe ndị a ga-emezuriri. Chineke ga-emekwa ya nʼoge na-adịghị anya.
GEN 41:33 “Ma ugbu a, ka Fero chọọ onye nwere ezi nghọta na amamihe. Ya mee ya onyeisi ọchịchị nʼala Ijipt niile.
GEN 41:34 Ka Fero mee nhọpụta ndị nlekọta ala Ijipt. Ka e debe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke nri niile a ga-enweta nʼoge ahụ nri ga-adị ukwuu nʼala Ijipt.
GEN 41:35 Ka ha kpokọtaa nri niile ga-adị nʼoge ịba ụba nke ihe oriri, nke ga-adị nʼafọ ndị a na-abịa. Ka ha kpokọta ha nʼụlọ ichebe nri nke ga-adị nʼokpuru ọchịchị Fero. Ka ọ bụrụ nri e debere nʼobodo dị iche iche.
GEN 41:36 A ga-echebe nri ndị a nke ọma maka ndị bi nʼala a, ka ọ bụrụ nri a ga-eri nʼime afọ asaa ndị ahụ nke ụnwụ ga-adị nʼala Ijipt, ka ụnwụ ghara ibibi ala a.”
GEN 41:37 Ntụpụta ahụ dị mma nʼanya Fero na ndịisi ọchịchị ya.
GEN 41:38 Fero jụrụ ndịisi ọchịchị ya, “Anyị ga-achọtali onye ọzọ dịka nwoke a, onye mmụọ nke Chineke dị nʼime ya?”
GEN 41:39 Ya mere Fero tụgharịrị sị Josef, “Ebe Chineke kpugheere gị ihe ndị a, o nweghị onye ọzọ nwere ezi nghọta na amamihe dịka gị.
GEN 41:40 Gị onwe gị ga-abụ onye na-elekọta ụlọeze m. Ndị m niile ga-erube isi nʼiwu ọbụla i nyere. Ọ bụ naanị nʼocheeze ka m ga-eji dị ukwuu karịa gị.”
GEN 41:41 Fero gwara Josef, “Lee, emeela m gị onye nlekọta ala Ijipt niile.”
GEN 41:42 Mgbe ahụ, Fero gbapụtara mgbaaka eze ya gbanye ya Josef nʼaka. O yikwasịkwara Josef uwe e ji ezi akwa ọcha duo, nyanye ya ihe ịnya nʼolu nke e ji ọlaedo kpụọ.
GEN 41:43 O mere ka ọ nyaa ịnyịnya ụgbọ ya nke abụọ. Ndị oti mkpu na-etikwa nʼihu ya, “Gbuonụ ikpere nʼala.” Otu a ka Fero si mee Josef onye na-achị ala Ijipt niile.
GEN 41:44 Fero gwakwara Josef sị, “Ọ bụ mụ onwe m bụ Fero! O nweghị onye ọbụla ga-ewelita aka maọbụ ụkwụ ya nʼala Ijipt niile ma ọ bụghị site nʼike i nyere ya.”
GEN 41:45 Fero gụrụ Josef aha Zafenat-Pania. Ọ kpọnyekwara ya, Asenat, nwa Pọtifera, onye nchụaja obodo a na-akpọ On, ka ọ bụrụ nwunye ya. Josef bịara gazuo ala Ijipt.
GEN 41:46 Josef gbara iri afọ atọ mgbe o bidoro iguzo nʼihu Fero eze Ijipt. O si nʼihu Fero pụọ, malite ijegharị ebe niile nʼala Ijipt.
GEN 41:47 Nʼafọ asaa ahụ nke a na-eriju afọ, ala mepụtara nri nʼebe ọ dị ukwuu.
GEN 41:48 Nʼime afọ asaa ndị a nke nri juru ebe niile nʼIjipt, Josef chịkọtara nri niile nke si nʼubi, ma chekwaa ha nʼụlọ e wuru maka iche nri nʼobodo niile ahụ. Nʼobodo ọbụla, ka ọ na-etinye ihe oriri nke si nʼubi gbara ya gburugburu.
GEN 41:49 Josef chekwara ọka dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. A kwụsịrị ịgụ ha ọnụ nʼihi na ha hiri nne nke ukwuu nke na ha enweghị ọnụọgụgụ.
GEN 41:50 Tupu oge ụnwụ ahụ ebido, Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On, mụtara Josef ụmụ ndị ikom abụọ.
GEN 41:51 Josef gụrụ ọkpara ya Manase, nʼihi na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m chefuo ahụhụ m niile, mekwa ka m chefuo ndị ezinaụlọ nna m.”
GEN 41:52 Josef gụrụ nwa ya nke abụọ Ifrem. Ọ sịrị, “Nʼihi na Chineke emeela ka m mịa mkpụrụ nʼala nke ahụhụ m.”
GEN 41:53 Afọ asaa nke ụba nri nke dịrị nʼala Ijipt mechara gabiga.
GEN 41:54 Afọ asaa nke ụnwụ bidoro bịawa dịka Josef kwuru. Ụnwụ nọ nʼobodo niile, ma nʼala Ijipt niile nri dị.
GEN 41:55 Ka agụ jidere ala Ijipt niile, ndị mmadụ tikuru Fero ka o nye ha nri. Ma Fero gwara ndị Ijipt niile, “Jekwurunụ Josef. Ihe ọbụla ọ gwara unu meenụ ya.”
GEN 41:56 Mgbe ụnwụ ahụ gbasara ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, Josef meghepụrụ ụlọ ichebe nri niile bido iresi ndị Ijipt nri, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Ijipt niile.
GEN 41:57 Mba niile bịara Ijipt ịzụ nri site nʼaka Josef nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼụwa niile.
GEN 42:1 Ugbu a, Jekọb nụrụ na ọka dị nʼIjipt. Ọ sịrị ụmụ ya, “Kedụ ihe anyị jiri nọrọ na-elerịta onwe anyị anya”
GEN 42:2 Ọ sịrị, “Lee anụrụ m na ọka dị nʼIjipt. Gbadatanụ nʼebe ahụ zụtara anyị ọka ka anyị dị ndụ ghara ịnwụ.”
GEN 42:3 Ụmụnne Josef iri ndị ahụ gbadara Ijipt ịzụta ọka.
GEN 42:4 Ma Jekọb ekweghị ka Benjamin nwanne nta Josef soro ha gaa, nʼihi na ọ tụrụ egwu na ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị ya.
GEN 42:5 Otu a, ụmụ Izrel so nʼọtụtụ ndị ọzọ ndị jekwara ịzụrụ nri nʼIjipt, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Kenan.
GEN 42:6 Nʼoge a, Josef na-achị ala Ijipt, bụrụkwa onye iresi ndị obodo ọka dị nʼaka. Ya mere, mgbe ụmụnne Josef rutere, ha bịara hulata kpọọ isiala nye Josef.
GEN 42:7 Mgbe Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara ndị ha bụ. Ma ọ kpara agwa dịka onye na-amaghị ha, gwa ha okwu nʼolu ike, sị ha, “Ebee ka unu si bịa?” Ha zara, “Anyị si ala Kenan bịa. Anyị bịara ịzụrụ nri.”
GEN 42:8 Josef matara ụmụnne ya, ma ha onwe ha amataghị onye ọ bụ.
GEN 42:9 Josef chetakwara nrọ ndị ahụ ọ rọrọ banyere ha. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu bụ ndị nnyocha. Ịchọpụta adịghị ike ala anyị mere unu ji bịa.”
GEN 42:10 Ha zara sị, “Nna anyị ukwu, anyị bụ ndị ohu gị bịara ịzụrụ nri.
GEN 42:11 Anyị niile bụ ụmụ otu nna. Ndị ohu gị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Anyị abụghị ndị nnyopụta.”
GEN 42:12 Ma Josef gwara ha sị, “Mba! Unu bịara ịchọpụta akụkụ obodo anyị nke a na-echezighị nke ọma.”
GEN 42:13 Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị dị ụmụnne iri na abụọ. Ọ bụkwa otu nna mụrụ anyị niile. Nna anyị na nwanne anyị nta, onye ikpeazụ ọ mụrụ nọ na Kenan ugbu a. Ma otu onye nʼime anyị anwụọla.”
GEN 42:14 Josef sịrị, “Ihe unu na-akọ na-egosi na unu bụ ndị nnyopụta, dịka m gwara unu.
GEN 42:15 Nke a ka a ga-eji anwale unu. Nʼaha Fero dị ndụ, unu agaghị esi nʼebe a laa tutu nwanne unu nke nta ahụ abịa nʼebe a.
GEN 42:16 Zipụnụ otu onye nʼime unu ka ọ gaa kpọta nwanne unu nwoke. Ma aga m etinye ndị fọdụrụ nʼụlọ mkpọrọ, tutu m chọpụta ma ihe unu kwuru ọ bụ eziokwu maọbụ ụgha. Ọ bụrụ ụgha nʼezie, dịka Fero na-adị ndụ, unu bụ ndị nnyopụta.”
GEN 42:17 O tinyere ha niile nʼụlọ mkpọrọ, hapụ ha nʼebe ahụ abalị atọ.
GEN 42:18 Josef gwara ha, nʼụbọchị nke atọ, “Nke a bụ ihe unu ga-eme ma dị ndụ, nʼihi na abụ m onye na-atụ egwu Chineke.
GEN 42:19 Ọ bụrụ na unu bụ ndị ezi mmadụ, ka otu onye nʼime unu nọdụ nʼebe a, nʼụlọ mkpọrọ, ka ndị fọdụrụ buru ọka bulaara ndị ezinaụlọ unu nọ nʼagụụ.
GEN 42:20 Ma kpọtaranụ m nwanne unu nke nta nʼebe a, nke a ga-egosi na okwu unu bụ eziokwu, na unu agaghịkwa anwụ.” Ha mere otu a.
GEN 42:21 Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Nʼezie, ọ bụ nʼihi nwanne anyị nwoke ka ahụhụ ndị a ji abịakwasị anyị. Anyị hụrụ obi mgbawa ya, mgbe ọ na-arịọ ka anyị chebe ndụ ya, ma anyị egeghị ya ntị. Ọ bụ nke a mere mmekpa ahụ ndị a ji bịakwasị anyị ugbu a.”
GEN 42:22 Ruben zara sị ha, “Ọ bụ na mụ agwaghị unu sị unu hapụ imejọ nwantakịrị ahụ, ma unu egeghị ntị? Ugbu a, anyị na-asa ajụjụ banyere ọbara ya.”
GEN 42:23 Ha amataghị na Josef na-anụ ihe ha na-ekwu, nʼihi na onye nsụgharị okwu nọ nʼetiti ha.
GEN 42:24 O sitere nʼebe ha nọ tụgharịa gaa kwaa akwa. Ọ lọghachikwutere ha ọzọ gwakwa ha okwu. O si nʼetiti ha kpọpụta Simiọn kee ya agbụ ka ha na-ele ya anya.
GEN 42:25 Josef nyere iwu ka e kpojuo ọka nʼakpa ha, tinyekwara onye ọbụla ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Ọ nyere iwu ka e nye ha ihe ha ga-eri nʼụzọ. Mgbe e mesịrị ihe ndị a,
GEN 42:26 ha bokwasịrị ịnyịnya ibu akpa ọka ha nʼotu nʼotu. Ha hapụrụ Ijipt lawa.
GEN 42:27 Mgbe ha ruru ebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, otu nʼime ha meghere akpa ya ka o nye ịnyịnya ibu ya ọka, ọ hụrụ ego ya nʼọnụ akpa ya.
GEN 42:28 Ọ gwara ụmụnne ya sị, “Lee, e tighachiri ego m kwụrụ. Lee ya nʼakpa ọka m.” Ike gwụrụ onye ọbụla nʼime ha. Site nʼahụ ịma jijiji ha lerịtara onwe ha anya sị, “Gịnị bụ ihe a Chineke mere anyị?”
GEN 42:29 Mgbe ha lakwutere nna ha Jekọb nʼala Kenan, ha kọọrọ ya ihe niile dakwasịrị ha. Ha gwara ya sị,
GEN 42:30 “Nwoke na-achị ala ahụ gwara anyị okwu nʼolu ike. O mesoro anyị mmeso dịka anyị bụ ndị bịara inyochapụta obodo ha.
GEN 42:31 Ma anyị gwara ya sị, ‘Anyị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi, ndị na-abụghị ndị nnyopụta obodo.
GEN 42:32 Anyị dị ụmụnne iri na abụọ ndị nwere otu nna. Otu nʼime anyị anọkwaghị, ma nke ntakịrị na nna anyị nọ na nʼala Kenan taa.’
GEN 42:33 “Mgbe ahụ, nwoke a, onye na-achị ala ahụ, sịrị anyị, ‘Nke a ka m ga-eji mata ma unu bụ ndị ezi mmadụ. Hapụrụnụ m otu nwanne unu. Burunu ọka, bulaara ndị ezinaụlọ unu agụụ na-agụgbu.
GEN 42:34 Ma kpọtara m nwanne unu nke nta. Mgbe ahụ ka m ga-ama ihe unu bụ. Ma unu bụ ndị nnyopụta maọbụ ndị ezi mmadụ. Mgbe ahụ, aga m ahapụrụ unu nwanne unu. Unu ga na-azụkwa ahịa nʼala a.’ ”
GEN 42:35 Mgbe ha bidoro ịwụpụtasị ọka dị nʼakpa ha, lee, nʼime akpa ọka onye ọbụla, a chọtara ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Mgbe ha na nna ha hụrụ ego ndị a, ha tụrụ egwu.
GEN 42:36 Ya mere, nna ha Jekọb gwara ha sị, “Unu agbawala m aka ụmụ. Josef anọghị, Simiọn anọkwaghị. Ma unu na-achọ iwezuga Benjamin. Naanị m ka ihe niile ndị a na-emegide!”
GEN 42:37 Mgbe ahụ, Ruben gwara nna ya sị, “I nwere ike gbuo ụmụ m ndị ikom abụọ ma ọ bụrụ na m akpọghachighị Benjamin. Tifee ya nʼaka m, aga m akpọghachikwara gị ya.”
GEN 42:38 Ma Jekọb sịrị, “Nwa m agaghị eso unu gaa. Nʼihi na nwanne ya anwụọla, ọ bụkwa naanị ya ka ọ fọdụrụ. Ọ bụrụ na nsogbu ezute ya nʼụzọ nʼije a, unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ mwute.”
GEN 43:1 Ma ụnwụ a siri oke ike nʼala ahụ nʼoge a.
GEN 43:2 O ruo, mgbe ha richara nri ha zụtara nʼIjipt, nna ha gwara ha sị, “Jeghachinụ, zụtara anyị ntakịrị nri.”
GEN 43:3 Juda gwara nna ya bụ Jekọb sị, “Nwoke ahụ dọsiri anyị aka na ntị ike sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanne unu esoghị unu bịa.’
GEN 43:4 Ọ bụrụ na ị ga-edunyere anyị nwanne anyị, anyị ga-agbada gaa zụtara gị nri.
GEN 43:5 Ma ọ bụrụ na ị gaghị edunyere anyị ya, anyị agaghị agbada, nʼihi na nwoke a sịrị anyị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanna unu esoghị unu.’ ”
GEN 43:6 Mgbe ahụ Izrel sịrị, “Gịnị mere unu ji wetara m nsogbu dị otu a, site nʼịgwa nwoke ahụ na unu nwere nwanne ọzọ.”
GEN 43:7 Ha zara sị, “Nwoke a jụrụ anyị ajụjụ dị iche iche banyere onwe anyị, na ndị ezinaụlọ anyị. Ọ sị, ‘Nna unu, ọ dị ndụ ugbu a? Unu nwere nwanne ọzọ?’ Ya mere, anyị zara ajụjụ niile. O nweghị otu anyị siri mara na ọ ga-asị anyị kpọta nwanne anyị.”
GEN 43:8 Mgbe ahụ, Juda sịrị nna ya Izrel, “Dunye m nwantakịrị a ka anyị bilie gawa, ka anyị dị ndụ ghara ịnwụ, ma anyị onwe anyị, ma gị, ma ụmụntakịrị anyị.
GEN 43:9 Aga m eji onwe m gbaa ebe nʼihi ya. I nwere ike itife ya nʼaka m. Ọ bụrụ na m akpọtaghachighị ya, kpọbata ya nʼihu gị, mgbe ahụ, ịta ụta bụrụ nke m nʼihu gị, nʼụbọchị ndụ m niile.
GEN 43:10 A sị nnọọ na anyị egbughị oge niile a, anyị gaara aga ma lọtakwarị ugboro abụọ.”
GEN 43:11 Mgbe ahụ nna ha Izrel gwara ha sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-adịrịrị otu a, gịnị ọzọ ka anyị ga-eme. Kama mgbe unu na-aga, werenụ nʼakpa unu onyinye ịnata ihuọma nke bụ ihe niile kachasị mma nke si nʼala a welaara nwoke a. Werenụ nwantịntị mmanụ otite, na nwantịntị mmanụ aṅụ, ha na ụda dị iche iche, na eso osisi máá, na akụ, na alụmọnd.
GEN 43:12 Werekwanụ ego okpukpu abụọ nʼaka unu. Weghachirinụ ya ego ahụ e tinyere nʼọnụ akpa unu, eleghị anya ọ bụ nʼohihie anya ka ha ji tinye ya.
GEN 43:13 Ngwa, kpọrọnụ nwanne unu nwoke bilienụ laghachikwurunụ nwoke ahụ.
GEN 43:14 Ka Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, mee ka nwoke ahụ nwee obi ebere nʼebe unu nọ. Ya meekwa ka o nwee ike ịhapụrụ unu nwanne unu Simiọn na Benjamin ka ha soro unu lọta. Ọ bụrụkwanụ uche Chineke na m ga-agbara aka ụmụ, ya mee dịka o si chọọ.”
GEN 43:15 Ya mere, ndị ikom ahụ weere onyinye ndị a, na okpukpu ego abụọ nʼaka, ma kpọrọkwa Benjamin. Ha biliri ije. Garuo Ijipt, ma guzo nʼihu Josef.
GEN 43:16 Mgbe Josef lepụrụ anya hụ Benjamin nʼetiti ha, ọ gwara onye na-elekọta ụlọ ya sị, “Duru ndị ikom ndị a gaa nʼụlọ. Gbuo anụ, kwadoo nri, nʼihi na ndị a ga-eso m rie nri ehihie.”
GEN 43:17 Odibo a mere dịka Josef ziri ya. O duuru ndị ikom ndị ahụ gaa nʼụlọ Josef.
GEN 43:18 Nʼoge a, mgbe a kpọbatara ha nʼụlọ, ndị ikom ndị ahụ tụrụ ụjọ, nʼihi na a kpọbatara ha nʼime ụlọ Josef. Ha sịrị, “Ọ bụ nʼihi ego ahụ e tighachiri nʼakpa anyị nʼoge mbụ ka e ji kpọbata anyị, ka o nwee ike ịchọta ụzọ ọ ga-esi megide anyị, mesie anyị ike, si otu a were anyị na ịnyịnya ibu anyị dịka ndị ohu ya.”
GEN 43:19 Ha bịaruru odibo Josef ahụ nso gwa ya okwu nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ.
GEN 43:20 Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, anyị bịara ebe a nʼoge mbụ ịzụ ihe oriri.
GEN 43:21 Ma, mgbe anyị rutere ebe anyị nọrọ ọnọdụ abalị, anyị meghere akpa anyị, chọpụta ego anyị kwụrụ nʼihi nri ahụ anyị zụrụ ka ọ dị nʼọnụ akpa anyị nʼotu na otu. E sepụkwaghị ya ihe ọ bụla. Ya mere, anyị weghachiri ya nʼoge a.
GEN 43:22 Anyị jikwa ego ọzọ anyị ga-eji zụọ ihe oriri. Ma anyị amaghị onye tinyere ego ahụ nʼime akpa anyị.”
GEN 43:23 Odibo ahụ zara sị ha, “Udo dịrị unu, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu, na Chineke nna unu enyela unu akụ zoro ezo nʼime akpa unu. Ego unu kwụrụ ruru m aka.” Mgbe ahụ, ọ hapụrụ ha gaa kpọpụta Simiọn.
GEN 43:24 Nʼoge ahụ, odibo ahụ duuru ndị ikom ndị ahụ bata nʼụlọ Josef, nye ha mmiri ha ji saa ụkwụ ha. O nyekwara ịnyịnya ibu ha nri.
GEN 43:25 Mgbe ahụ, ụmụ Jekọb kwadoro onyinye ịnata ihuọma ha ji bịa, nke ha ga-enye Josef ma ọ bata nʼetiti ehihie, nʼihi na ha anụla na ha ga-eri nri nʼebe ahụ.
GEN 43:26 Mgbe Josef lọtara ụlọ, ha wetaara ya onyinye dị nʼaka ha, daa nʼala, kpọọ isiala nye ya.
GEN 43:27 Josef jụrụ ha ajụjụ banyere ọdịmma ha, jụọkwa ha sị, “Agadi nna unu, nke unu gwara m ihe banyere ya, ahụ ọ dịkwa ya? Ọ ka dịkwa ndụ.”
GEN 43:28 Ha zaghachiri sị ya, “Ahụ dị ohu gị bụ nna anyị. Ọ ka nọ ndụ.” Ha hulatara isi ha, kpọọ isiala nye ya.
GEN 43:29 Mgbe Josef welitere anya ya elu hụ nwanne ya Benjamin, onye bụ nwanne afọ ya, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye a ọ bụ nwanne unu nke nta ahụ unu gwara m ihe banyere ya?” Tupu ha asaa ya ihe ọbụla, o lere Benjamin anya sị ya, “Ka amara Chineke dịrị gị, nwa m nwoke.”
GEN 43:30 Mgbe ahụ kwa Josef mere ọsịịsọ pụọ nʼezi ịchọ ebe ọ ga-akwa akwa nʼihi na ọhụhụ ọ hụrụ nwanne ya anya ọzọ metụrụ ya nnọọ nʼobi. Ọ pụrụ banye nʼime ụlọ ya kwaa akwa.
GEN 43:31 Emesịa, ọ sara ihu ya, pụta, jisie onwe ya ike nye odibo ya iwu ka o bute nri ahụ.
GEN 43:32 Ha doziiri ya nri nke ya iche, doziekwara ụmụnne ya nri nke ha iche. Otu a kwa, ha dozikwaara ndị Ijipt ya na ha na-erikọ nri, nri nke ha iche. Nʼihi na ọ bụ ihe arụ nʼanya ndị Ijipt na ha na ndị Hibru ga-erikọta nri ọnụ.
GEN 43:33 Ma mgbe e nyere ha ọnọdụ nʼihu Josef, e mere ka ha nọdụ dịka ha si tọọ ibe ha. Nke ọkpara buru ụzọ nọdụ, onye na-eso ya anọdụkwa. Otu a ka ha niile siri nọdụ ruo nʼonye ikpeazụ nʼime ha. Ha lerịtara onwe ha anya nʼihi na o juru ha anya.
GEN 43:34 O sitekwara na nri e doziri ya nyebinye ha nri. Nri e nyere Benjamin dị ukwuu okpukpu ise karịa nri nke e nyere ha niile. Ha na ya riri, ṅụọkwa nʼuju.
GEN 44:1 Mgbe ahụ Josef nyere odibo nọ nʼụlọ ya iwu sị, “Gbajuo akpa ndị ikom ndị a nri. Tinyere ha nri nke onye ọbụla nʼime ha nwere ike ibu, tinyekwa ego nke onye ọbụla nʼime ha kwụrụ nʼọnụ akpa ya.
GEN 44:2 Ma tinye iko ọlaọcha m nʼime ọnụ akpa onye nke nta nʼime ha. Tinyekwa ego ọ kwụrụ nʼihi nri ọ zụrụ nʼime akpa ya.” Odibo a mere dịka Josef gwara ya.
GEN 44:3 Mgbe chi bọrọ, ha zipụrụ ndị ikom ndị a, ha na ịnyịnya ibu ha.
GEN 44:4 Mgbe ha ji naanị ihe nta gafee obodo ahụ, Josef gwara odibo ya sị, “Bilie, chụso ndị ikom ndị ahụ ọsọ. I zute ha, sị ha, ‘Gịnị mere unu ji were ihe ọjọọ kwụghachi ihe ọma?
GEN 44:5 Gịnị mere unu ji zuru iko ọlaọcha nna m ukwu, iko o ji aṅụ ihe ọṅụṅụ na nke o ji ajụ ase? Unu emeela ihe ọjọọ nʼihi ihe a unu mere.’ ”
GEN 44:6 Mgbe odibo ahụ zutere ha, ọ gwara ha ihe ndị a.
GEN 44:7 Ma ha zara sị ya, “Nna anyị ukwu, gịnị mere i ji ekwu ụdị okwu ndị a? Ihe arụ ka ọ bụ anyị ime ihe dị otu a.
GEN 44:8 Lee, ego anyị chọtara nʼọnụ akpa anyị ka anyị sitere nʼala Kenan weghachi. Olee otu anyị ga-esi zuru ọlaedo maọbụ ọlaọcha site nʼụlọ nna gị ukwu?
GEN 44:9 Onye ọbụla nʼime anyị a chọtara iko a nʼaka ya ga-anwụ. Anyị onwe anyị ga-aghọrọ nna anyị ukwu ndị ohu.”
GEN 44:10 Odibo ahụ zara sị ha, “Ka ọ dịrị dịka unu kwuru. Onye ọbụla a chọtara ya nʼaka ga-abụ ohu m. Ma ndị a na-achọtaghị ya nʼaka ha enweghị ịta ụta ọbụla.”
GEN 44:11 Ha mere ngwangwa, onye ọbụla tọdatara akpa ya. Onye ọbụla kwa meghere akpa ya.
GEN 44:12 Odibo ahụ malitere nʼonye ukwu nʼetiti ha chọọ rute nʼonye nta. Ọ bụ nʼakpa Benjamin ka a chọtara iko ahụ.
GEN 44:13 Mgbe ahụ, ha dọwara uwe ha nʼihi mwute. Onye ọbụla nʼime ha tighachiri ibu ya nʼelu ịnyịnya ibu ya. Ha niile bidokwara ịlaghachi azụ nʼobodo ha si pụta.
GEN 44:14 Mgbe Juda na ụmụnne ya lọghachiri nʼụlọ Josef, ha hụrụ Josef ka ọ nọ nʼebe ahụ. Ha dara nʼala nʼihu ya.
GEN 44:15 Ma Josef jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ihe a unu mere? Ọ bụ na unu amataghị na onye dịka m nwere ike ịmata onye zuru iko m?”
GEN 44:16 Ya mere Juda sị ya, “Gịnị ka anyị ga-ekwu? Olee otu anyị ga-esi gosi nʼaka anyị dị ọcha? Chineke ekpugheela ikpe ọmụma ndị ohu gị. Lee, anyị bụkwa ndị ohu onyenwe m. Anyị onwe anyị, tinyekwara onye a chọtara iko ahụ nʼaka ya.”
GEN 44:17 Ma Josef sịrị, “Ọ ga-abụrụ m ajọ omume ime ihe dị otu ahụ. Naanị nwoke ahụ a chọpụtara iko ahụ nʼakpa ya bụ onye ga-abụ ohu m. Ma unu onwe unu nwere ike laa nʼudo jekwuru nna unu nʼudo.”
GEN 44:18 Juda jekwuuru ya, sị, “Biko, onyenwe m, kwere ka ohu gị gwa gị okwu. Ewesola mụ bụ ohu gị iwe nʼihi na ị nọ ọnọdụ dị ka Fero.
GEN 44:19 Onyenwe m, ọ bụ gị jụrụ ndị ohu gị ajụjụ sị, ‘Unu nwere nna maọbụ nwanne?’
GEN 44:20 Anyị zara sị, ‘Anyị nwere nna onye bụ agadi, na otu nwa nwoke ọ mụtara nʼagadi ya. Nwanne nwantakịrị nwoke a anwụọla, ya mere naanị otu a fọdụrụ nʼime ụmụ nke nne ha mụtara. Nna ya hụkwara ya nʼanya.’
GEN 44:21 “Mgbe ahụ, ị sị ndị ohu gị, ‘Kpọta nwantakịrị a ka m hụ ya anya.’
GEN 44:22 Ma anyị gwara onyenwe m sị na ‘Nwata a apụghị ịhapụ nna ya, nʼihi na nna ya ga-anwụ ma ọ bụrụ na ọ hapụ ya.’
GEN 44:23 Ma ị gwara ndị ohu gị sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m anya ọzọ, ma ọ bụrụ na nwanne unu a esoghị unu gbadata.’
GEN 44:24 Mgbe anyị lakwuuru ohu gị bụ nna anyị, anyị gwara ya okwu onyenwe m kwuru.
GEN 44:25 “Mgbe nna anyị gwara anyị sị, ‘Laghachi gaa zụta nri,’
GEN 44:26 anyị gwara ya na, ‘Anyị agaghị agbada ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta agaghị eso anyị. Nʼihi na anyị enweghị ike ịhụ nwoke ahụ anya, ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta esoghị anyị.’
GEN 44:27 “Oge ahụ, ohu gị bụ nna anyị sịrị anyị, ‘Unu maara na nwunye m mụụrụ m ụmụ nwoke abụọ.
GEN 44:28 Otu nʼime ha funarịrị m, mgbe anụ ọhịa dọkasịrị ya iperipe na iperipe. Ruo ugbu a, ahụbeghị m ya anya.
GEN 44:29 Ọ bụrụ na unu anapụkwa m onye nke a, si otu a mee ka ihe ọjọọ zute ya, ọ pụtara na unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ?’
GEN 44:30 “Ya mere, ọ bụrụ na m alaghachikwute ohu gị, bụ nna anyị, ma nwantakịrị a esoghị anyị, ebe ọ bụ na e kekọtara ndụ nna anyị na ndụ nwantakịrị a,
GEN 44:31 mgbe ọ ga-ahụ na nwantakịrị a esoghị anyị, ọ ga-anwụ. Mgbe ahụ, anyị bụ ndị ohu gị, ga-eme ka nna anyị jiri isi awọ laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ.
GEN 44:32 Biko, onyenwe m, eji m ndụ m zọọrọ nna m ebe na m ga-elezi nwantakịrị a anya. Asị m ya, ‘Ọ bụrụ na m akpọghachighị nwantakịrị a nye gị, ka ịta ụta bụrụ nke m nʼihu gị bụ nna m nʼụbọchị niile nke ndu m.’
GEN 44:33 “Ya mere ugbu a, biko, ka ohu gị nọdụ dịka ohu onyenwe m nʼọnọdụ nwantakịrị a, ka nwantakịrị a soro ụmụnne ya laghachikwuru nna anyị.
GEN 44:34 Aga m esi aṅaa laghachikwuru nna m ma ọ bụrụ na mụ na nwantakịrị a esoghị? Enweghị m ike ilekwasị ihe ọjọọ ga-adakwasị nna m anya.”
GEN 45:1 Nʼoge a, Josef enwekwaghị ike ijite onwe ya aka nʼihu ndị na-ejere ya ozi. O welitara olu sị, “Zipụnụ onye ọbụla site nʼebe m nọ.” Ya mere, o nweghị onye ya na Josef nọ mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya onye ọ bụ.
GEN 45:2 O tiri mkpu akwa nke ndị Ijipt nụrụ, na nke ndị ụlọ Fero nụkwara.
GEN 45:3 Josef gwara ụmụnne ya sị, “Mụ onwe m bụ Josef. Nna m ọ ka nọ ndụ ugbu a?” Ma ụmụnne ya enweghị ọnụ ha ji asa ya, nʼihi na oke egwu jidere ha nʼihu ya.
GEN 45:4 Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Biko, bịanụ m nso.” Mgbe ha bịara ya nso, ọ sịrị ha, “Abụ m nwanne unu, Josef, onye unu rere ree gaa Ijipt.
GEN 45:5 Ma otu ọ dị, ka ọ ghara iwute unu, unu atakwala onwe unu ụta nʼihi orure unu rere m. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ichebe ndụ unu ka Chineke ji buru ụzọ zite m nʼebe a.
GEN 45:6 Oge ụnwụ agwụchabeghị. Ọ bụ ezie na afọ abụọ nke oke ụnwụ agafeela, ma ọ fọdụrụ afọ ise ọzọ nʼihu, oge a na-agaghị akọ ihe ọbụla nʼala, maọbụ iwere ihe ọbụla nʼubi.
GEN 45:7 Chineke zitere m ka m buru ụzọ bịa nʼebe a nʼihi ime ka ndụ fọdụrụ unu nʼụwa, na ịzọpụta ndụ unu site nʼụzọ nnapụta dị oke egwu.
GEN 45:8 “Ya mere, ọ bụghị unu zitere m nʼebe a, kama ọ bụ Chineke. Ya onwe ya emeela ka m ghọọrọ Fero nna, na onyeisi ezinaụlọ ya niile, na onye na-achị ala Ijipt niile.
GEN 45:9 Ugbu a, meenụ ngwa lakwuru nna m, sị ya, ‘Ihe ndị a ka Josef nwa gị nwoke kwuru, Chineke emeela m onye na-achị Ijipt niile. Egbula oge ịbịakwute m.
GEN 45:10 Ị ga-ebi nʼala Goshen, ka i nwee ike ịnọ m nso, gị na ụmụ gị, na ụmụ ụmụ gị, na igwe ewu na atụrụ gị, na igwe ehi gị, na ihe niile i nwere.
GEN 45:11 Nʼebe ahụ ka m ga-enyekwa gị ihe ị chọrọ, nʼihi na ụnwụ afọ ise ka dị nʼihu na-abịa. Ọ bụrụ na i meghị otu a, gị na ezinaụlọ gị na ihe niile bụ nke gị ga-ada ụkpa.’
GEN 45:12 “Nʼezie, anya unu na nʼanya nwanne m Benjamin, ahụla na mụ onwe m ji ọnụ m na-agwa unu okwu ndị a.
GEN 45:13 Unu ga-akọrọ nna m maka nsọpụrụ niile a na-enye m nʼala Ijipt na ihe niile unu hụrụ. Kpọtakwanụ nna m ọsịịsọ ebe a.”
GEN 45:14 Ugbu a, ọ dakwasịrị nʼolu Benjamin, nwanne ya, kwaa akwa. Benjamin jidekwara ya nʼolu kwaa akwa.
GEN 45:15 Emesịa, o suturu ụmụnne ya niile ọnụ, bekwasịkwa ha akwa. Nʼikpeazụ, ụmụnne ya kpanyeere ya ụka.
GEN 45:16 Mgbe akụkọ a ruru ụlọ Fero na ụmụnne Josef bịara, ọ tọrọ Fero na ndịisi ozi niile ya ụtọ.
GEN 45:17 Fero gwara Josef sị ya, “Gwa ụmụnne gị, ka ha mee ihe otu a, ha bokwasị ịnyịnya ibu unu ibu laghachikwa nʼala Kenan.
GEN 45:18 Ha ruo, ha kpọta nna gị, na ezinaụlọ ha, ka ha lọghachikwute m nʼala Ijipt. Nʼihi na aga m enye ha ala kachasị mma nʼIjipt. Ha onwe ha ga-erikwa uru ala ahụ.
GEN 45:19 “Gwakwa ụmụnne gị okwu sị ha, ‘Sitenụ nʼala Ijipt were ụgbọala, nke unu ga-eji budata ndị nwunye unu na ụmụntakịrị unu. Dutekwanụ nna unu.
GEN 45:20 Unu esogbula onwe unu banyere ngwa ụlọ unu, nʼihi na ihe niile dị mma nʼala Ijipt bụ nke unu.’ ”
GEN 45:21 Ya mere ụmụ Izrel mere ihe ndị a. Josef nyere ha ụgbọala dịka Fero nyere nʼiwu. O nyekwara ha nri ha ga-eri nʼụzọ.
GEN 45:22 O nyere onye ọ bụla nʼime ha uwe mgbanwe ọhụrụ, ma o nyere Benjamin narị shekel ọlaọcha atọ, na uwe mgbanwe ise.
GEN 45:23 O zipụụrụ nna ya ihe ndị a: ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ihe mara mma niile si nʼala Ijipt, na nne ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ọka na achịcha, na ihe ndị ọzọ dị iche iche, nʼihi ije ya.
GEN 45:24 O zipụrụ ụmụnne ya. Ma oge ha na-achọ ịhapụ ya, ọ gwara ha sị, “Unu esekwala okwu nʼụzọ.”
GEN 45:25 Mgbe ahụ, ha hapụrụ ala Ijipt mechaa rute ala Kenan, bịakwute Jekọb nna ha.
GEN 45:26 Ha gwara ya sị, “Josef ka nọ ndụ. Nʼezie, ọ bụ ya na-achị ala Ijipt niile.” Ma o siiri Jekọb ike ịnabata akụkọ a. O kwenyeghị na ọ bụ eziokwu.
GEN 45:27 Ma mgbe ha gwasịrị ya ihe niile Josef gwara ha, mgbe ọ hụkwara ụgbọala niile Josef zitere ka e jiri bute ya, mmụọ nna ha Jekọb lọghachiri.
GEN 45:28 Mgbe ahụ Izrel kwuru sị, “Ekwetala m! Josef nwa m ka dị ndụ. Aga m aga hụ ya anya tupu m nwụọ.”
GEN 46:1 Izrel biliri ije, ya na ihe niile o nwere rute Bịasheba. Ebe a, ọ chụrụ aja nye Chineke nke nna ya Aịzik.
GEN 46:2 Chineke gwara Izrel okwu nʼọhụ nke abalị. Ọ sịrị, “Jekọb! Jekọb!” Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.”
GEN 46:3 Chineke gwara ya sị, “Abụ m Chineke, Chineke nke nna gị. Atụla egwu ịgbada Ijipt nʼihi na aga m eme gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu nʼebe ahụ.
GEN 46:4 Mụ onwe m ga-eso gị agbada nʼala Ijipt. Mụ onwe m ga-akpọlatakwa gị ọzọ. Josef nʼonwe ya ga-eji aka ya ekpuchikwa gị anya.”
GEN 46:5 Jekọb mechara si na Bịasheba pụta. Ụmụ Izrel kuuru Jekọb nna ha, na ụmụaka ha na ndị nwunye ha, kubanye nʼụgbọala ahụ Fero zitere ka ha ji bute ya.
GEN 46:6 Ha buuru anụ ụlọ ha niile, na ihe onwunwe ha niile, nke ha kpatara nʼala Kenan, gaa Ijipt. Jekọb na agbụrụ ya niile so.
GEN 46:7 Ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ya ndị inyom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị inyom niile, na ndị niile bụ mkpụrụ afọ ya, ka ọ kpọrọ gaa Ijipt.
GEN 46:8 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel, ya bụ Jekọb na ụmụ ụmụ ya, ndị sooro ya gaa Ijipt. Ruben, ọkpara Jekọb
GEN 46:9 Ụmụ ndị ikom Ruben bụ, Hanok, na Palu, na Hezrọn na Kami.
GEN 46:10 Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ, Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoha, na Shaul. Nne Shaul bụ nwanyị Kenan.
GEN 46:11 Ụmụ ndị ikom Livayị bụ, Geshọn, na Kohat, na Merari.
GEN 46:12 Ụmụ ndị ikom Juda bụ, Ịa, na Onan, na Shela, na Perez, na Zera. Ma Ịa na Onan nwụrụ nʼala Kenan. Ụmụ ndị ikom Perez bụ, Hezrọn na Hamul.
GEN 46:13 Ma ụmụ ndị ikom Isaka bụ, Tola, na Puva, na Jashub, na Shịmrọn.
GEN 46:14 Ụmụ ndị ikom Zebụlọn bụ, Sered, na Elọn, na Jaliil.
GEN 46:15 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Lịa mụụrụ Jekọb nʼala Padan Aram. Ọ mụtakwara otu nwanyị aha ya bụ Daịna. Ụmụ ndị ikom na ndị inyom ndị a dị iri atọ na atọ.
GEN 46:16 Ụmụ ndị ikom Gad bụ, Zefọn, na Hagi, na Shuni, na Ezbon, na Eri, na Arodi na Areli.
GEN 46:17 Ụmụ ndị ikom Asha bụ, Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwanne ha nwanyị bụ Sera. Ụmụ Beriya bụ, Heba na Malkiel.
GEN 46:18 Ndị a bụ ụmụ a mụụrụ Jekọb site na Zilpa, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere Lịa nwa ya nwanyị. Ha dị iri na isii nʼọnụọgụgụ.
GEN 46:19 Ụmụ ndị ikom Jekọb site na Rechel nwunye ya bụ, Josef na Benjamin.
GEN 46:20 Nʼala Ijipt, a mụụrụ Josef Manase na Ifrem, site na nwunye ya Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On.
GEN 46:21 Ụmụ ndị ikom Benjamin bụ, Bela, Beka, Ashbel, Gera, Neeman, Ehi, Rosh, Mupim, Hupim na Aad.
GEN 46:22 Ndị a bụ ndị ikom nke Rechel mụụrụ Jekọb. Ha dị iri na anọ.
GEN 46:23 Nwa nwoke nke Dan mụrụ bụ, Hushim.
GEN 46:24 Ụmụ ndị ikom Naftalị bụ, Jaziil, na Guni, na Jeza, na Shilem.
GEN 46:25 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom a mụụrụ Jekọb site na Bilha, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere nwa ya nwanyị Rechel. Ha niile dị asaa.
GEN 46:26 Ya mere, ndị niile so Jekọb gaa Ijipt, ndị bụ ụmụ ụmụ ya, na-agụghị ndị nwunye ụmụ Jekọb niile, dị iri mmadụ isii na isii.
GEN 46:27 Tinyere ụmụ ndị ikom abụọ amụtara nye Josef nʼIjipt, ndị si nʼezinaụlọ Jekọb gara Ijipt dị iri asaa.
GEN 46:28 Jekọb zipụrụ Juda ka jekwuru Josef ịjụta ya ụzọ Goshen. Mgbe ha rutere nʼala Goshen,
GEN 46:29 Josef kwadoro ịnyịnya ụgbọ ya gawa Goshen izute nna ya Izrel. Mgbe Josef bịara nʼihu nna ya, ọ makụrụ ya, bee akwa ogologo oge.
GEN 46:30 Izrel gwara Josef sị, “Ugbu a ejikerela m ịnwụ, ebe m hụrụ ihu gị anya ọzọ, mata na ị ka dị ndụ.”
GEN 46:31 Mgbe ahụ, Josef gwara ụmụnne ya na ndị ezinaụlọ nna ya niile sị, “Ka m gaa kọọrọ Fero. Ka m gaa sị ya, ‘Ụmụnne m na ezinaụlọ nna m, ndị bi nʼala Kenan abịakwutela m.
GEN 46:32 Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, ndị na-elekọta anụ ụlọ. Ha chị igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, na ihe niile ha ji biri.’
GEN 46:33 Ya mere, ọ bụrụ na Fero akpọ unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị bụ ọrụ aka unu?’
GEN 46:34 Unu ga-asị ya, ‘Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ anụ ụlọ site na mgbe anyị bụ ụmụnta, dịka nna nna anyị ha bụ.’ Mgbe ahụ, ọ ga-ekwe ka unu biri nʼala Goshen. Nʼihi na ndị niile na-azụ ewu na atụrụ bụ ndị akpọrọ asị nʼala Ijipt.”
GEN 47:1 Josef gara gwa Fero sị, “Nna m na ụmụnne m ejirila igwe ewu na atụrụ ha, igwe ehi ha na ihe niile ha nwere site nʼala Kenan bịa nʼebe a. Ha nọ nʼala Goshen.”
GEN 47:2 Mgbe ọ gara ịgwa Fero okwu, o duuru mmadụ ise nʼetiti ụmụnne ya ndị ikom gosi ha Fero.
GEN 47:3 Fero jụrụ ụmụnne ya ajụjụ sị ha, “Gịnị bụ ọrụ aka unu?” Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ atụrụ dịka nna nna anyị ha.”
GEN 47:4 Ha kwukwara sị, “Anyị bịara ịnọ dịka ọbịa nʼala a nʼihi na ụnwụ a siri oke ike nʼala Kenan. O nweghị nri igwe ewu na atụrụ anyị nwere iri nʼala ahụ. Ya mere, anyị na-arịọ ka i nye ndị ohu gị ike ka ha biri nʼala Goshen.”
GEN 47:5 Fero gwara Josef sị, “Nna gị na ụmụnne gị abịakwutela gị. Ha biri nʼala Goshen.
GEN 47:6 Ala Ijipt dịkwa gị nʼihu. Họrọ ebe ọbụla masịrị gị nke dịkwa ezi mma nye nna gị na ụmụnne gị ka ha biri. Ka ha biri na Goshen. Ọ bụrụkwa na ị maara ndị ikom nʼetiti ha ndị nwere ike, mee ha ndị na-elekọta igwe anụ ụlọ m.”
GEN 47:7 Josef kpọtara nna ya Jekọb, mee ka o guzo nʼihu Fero. Jekọb nọ nʼebe ahụ gọzie Fero.
GEN 47:8 Fero jụrụ Jekọb sị, “Ị gbaala afọ ole ugbu a?”
GEN 47:9 Jekọb zara Fero sị ya: “Ebiela m dịka onye ọbịa narị afọ na iri afọ atọ. Ọnụọgụgụ afọ ndị a ehighị nne, ma ha jupụtara nʼahụhụ na nsogbu. Ma a nọrubeghị m ọnụọgụgụ afọ nna m ha gbara mgbe ha biri nʼụwa dịka ọbịa.”
GEN 47:10 Jekọb gọziri Fero, site nʼihu ya pụọ.
GEN 47:11 Ya mere, Josef mere ka nna ya na ụmụnne ya biri nʼala Ijipt. O nyere ha ala kachasị mma nʼala ahụ na mpaghara Ramesis, dịka Fero nyere nʼiwu.
GEN 47:12 Josef nyere nna ya na ụmụnne ya na ezinaụlọ nna ya nri dịka ọnụọgụgụ nke ụmụ ha si dị.
GEN 47:13 Ma nri adịghị nʼala ahụ niile nʼihi na ụnwụ ahụ dị nnọọ njọ. Ihe siri ike nʼala Ijipt ma nʼala Kenan nʼihi ụnwụ a.
GEN 47:14 Josef chịkọtara ego niile dị nʼala Ijipt, na nʼala Kenan, nke ndị mmadụ ji kwụọ ụgwọ nri ha zụrụ webata ha nʼụlọeze Fero.
GEN 47:15 Mgbe ego niile dị ndị mmadụ nʼaka gwụchara nʼala Ijipt ma nʼala Kenan, ndị Ijipt niile bịakwutere Josef sị ya, “Nye anyị nri, gịnị mere anyị ga-eji nwụọ nʼihu gị? Ego anyị agwụla.”
GEN 47:16 Mgbe ahụ Josef zara sị ha: “Jirinụ anụ ụlọ unu kwụọ ụgwọ nri m ga-enye unu, ebe ọ bụ na ego unu agwụla.”
GEN 47:17 Ya mere, ha kpụtaara Josef anụ ụlọ ha. Josef nyere ha nri nʼọnọdụ ịnyịnya ha, na atụrụ ha, na ewu ha, na ehi, na ịnyịnya ibu ha. O were nri zụọ ha nʼafọ ahụ nʼọnọdụ anụ ụlọ ha niile.
GEN 47:18 Mgbe afọ ahụ gafesịrị, ha bịakwutekwara ya nʼafọ nke ọzọ sị ya, “Anyị agaghị ezoro onyenwe anyị na ego anyị agwụla, na igwe anụ ụlọ anyị bụkwa nke gị. O nweghị ihe ọzọ fọdụrụ anyị karịa ahụ anyị na ala anyị.
GEN 47:19 Gịnị mere anyị ga-eji nọọ nʼagụụ nʼihu gị? Zụrụ anyị na ala anyị nʼọnọdụ ụgwọ anyị ga-akwụ maka nri ị ga-enye anyị. Ka anyị na ala anyị bụrụ ndị ohu Fero. Nye anyị mkpụrụ ubi ka anyị dịrị ndụ ghara ịnwụ, ka ala a ghara ịbụ ihe tọgbọrọ nʼefu.”
GEN 47:20 Ya mere, Josef zụtaara Fero ala Ijipt niile. Ndị Ijipt niile nʼotu nʼotu rere ala ha nʼihi oke ụnwụ ahụ dakwasịrị ha. Mgbe ahụ, ala ha niile ghọrọ nke Fero.
GEN 47:21 Ya mere, Josef si otu a mee ka ndị Ijipt niile ghọọ ndị ohu Fero, site nʼotu obodo nʼala ahụ ruo na nke ọzọ ya.
GEN 47:22 Ala nke Josef na-azụtaghị nʼoge a bụ naanị ala ndị nchụaja. Nʼihi na ndị nchụaja si nʼaka Fero na-enweta nri ha site nʼoge ruo nʼoge. Ha nwekwara nri na-ezuru ha site na oke ahụ Fero na-enye ha. Ya mere ha ereghị ala ha.
GEN 47:23 Mgbe ahụ, Josef gwara ndị mmadụ ahụ niile okwu sị, “Lee, azụọla unu taa, zụkwaa a ala unu nye Fero.
GEN 47:24 Nʼoge owuwe ihe ubi, otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe unu nwetara nʼubi unu bụ nke Fero. Deberenụ onwe unu ụzọ anọ fọdụrụ ka ọ bụrụ ihe unu ga-akụ nʼubi na ihe unu ga-eri na ihe ndị ezinaụlọ unu, na nke ụmụntakịrị unu ga-eri.”
GEN 47:25 Ha zara sị ya, “Ị zọpụtala ndụ anyị. Ka anyị hụta amara nʼihu nna anyị ukwu. Anyị ga-abụ ndị ohu Fero.”
GEN 47:26 Josef mere ka nke a bụrụ iwu nʼala Ijipt niile ruo taa, na Fero ga-ewe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe ọbụla si nʼala. Naanị ihe si nʼala ndị nchụaja bụ nke na-esoghị nʼiwu a.
GEN 47:27 Izrel biri na Goshen nke dị nʼala Ijipt. Ha kpatara akụ hie nne, mụbaa nʼọmụmụ, ma nʼọnụọgụgụ.
GEN 47:28 Jekọb biri nʼala Ijipt afọ iri na asaa. Ya mere, afọ niile Jekọb gbara bụ narị afọ na iri afọ anọ na asaa.
GEN 47:29 Mgbe ụbọchị ọnwụ Izrel na-abịaru nso, ọ kpọrọ Josef nwa ya sị ya, “Ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, tinye aka gị nʼokpuru apata m, kwee m nkwa na ị ga-egosi m obi ebere na ezi ntụkwasị obi. Elila m nʼala nʼIjipt.
GEN 47:30 Kama, mgbe m nwụrụ, site nʼala Ijipt bupụ m. Buru ozu m gaa lie ya ebe e liri nna m ha.” Ọ zara, “Aga m eme dịka i kwuru.”
GEN 47:31 Ọ sịrị ya, “Ṅụọrọ m iyi na ị ga-eme ya.” Josef ṅụọrọ ya iyi. Izrel nʼonwe ya, kpọrọ isiala dịka ọ dabere nʼelu mkpanaka ya.
GEN 48:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, a gwara Josef sị, “Lee nna gị na-arịa ọrịa.” Josef biliri duru ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ Manase na Ifrem gawa ileta ya.
GEN 48:2 Mgbe a gwara Jekọb okwu sị ya, “Nwa gị nwoke Josef abịala ileta gị.” Izrel chịkọtara ume ya, jisie ike, nọdụ ala nʼelu akwa ya.
GEN 48:3 Mgbe ahụ, Jekọb sịrị Josef, “Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile gosiri m onwe ya na Luz, nʼala Kenan, ma gọziekwa m.
GEN 48:4 Ọ sịrị m, ‘Lee, aga m eme ka ị mịa mkpụrụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ị ghọọ ọgbakọ ọtụtụ mba. Aga m enye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nketa ebighị ebi maka agbụrụ gị ndị ga-esote gị.’
GEN 48:5 “Ugbu a, ana m eme ụmụ gị ndị ikom abụọ ndị a, ndị a mụtaara gị nʼala Ijipt, ụmụ nke m. Ha abụọ, Ifrem na Manase, ga-abụ ụmụ m, dịka Ruben na Simiọn si bụrụ ụmụ m.
GEN 48:6 Ma ụmụ ọzọ a ga-amụtara gị ga-abụ nke gị. Ọ bụ aha ụmụnne ha ndị a ka a ga-eji mara ha nʼala nketa nke ha.
GEN 48:7 Ana m eme nke a nʼihi na mgbe m si Padan Aram pụta, nne unu Rechel, nwụrụ nʼala Kenan mgbe anyị ka nọ nʼụzọ ije anyị nʼebe dịtụ anya site na Efrat. Nʼakụkụ ụzọ e si aga Efrat, ya bụ Betlehem, ka m likwara ya.”
GEN 48:8 Mgbe Izrel hụrụ ụmụ ndị ikom abụọ Josef kpọ bịa, ọ jụrụ Josef ajụjụ sị, “Ndị a, bụ ndị ole?”
GEN 48:9 Josef zara nna ya sị, “Ha bụ ụmụ ndị ikom ndị Chineke nyere m nʼebe a.” Ya mere, Jekọb gwara ya sị, “Kpọtara m ha, ka m gọzie ha.”
GEN 48:10 Nʼoge a, Izrel adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ime agadi ya. Ya mere, Josef duuru ụmụ ya ndị ikom ndị ahụ bịa nso ebe nna ya nọ. Mgbe ahụ, Jekọb suturu ha ọnụ, makụọ ha.
GEN 48:11 Izrel sịrị Josef, “O nweghị mgbe m lere anya na m ga-ahụ ihu gị ọzọ. Ma Chineke emeela ka m hụkwa ụmụ gị.”
GEN 48:12 Josef sitere nʼikpere Jekọb kupu ụmụ ya, bịa hulata isi ala. O kpuru ihu ya nʼala mgbe o mere nke a.
GEN 48:13 Josef kpọọrọ ha abụọ, Ifrem nʼaka nri ya nke bụ aka ekpe Izrel, na Manase nʼaka ekpe ya nke bụ aka nri Izrel, kpọta ha bịa nna ya nso.
GEN 48:14 Ma Izrel setịrị aka nri bikwasị ya nʼisi Ifrem, nwa nke nta. Ma aka ekpe ya ka o setịpụrụ bikwasị nʼisi Manase bụ ọkpara.
GEN 48:15 Mgbe ahụ, ọ gọziri Josef sị ya. “Ka Chineke, onye nna m ha Ebraham na Aịzik jere ije nʼihu ya Chineke onye bụrịị Onye zụrụ m dịka atụrụ ogologo ndụ m niile ruo taa,
GEN 48:16 Mmụọ ozi ahụ napụtara m site nʼihe egwu niile, ya gọzie ụmụ ndị ikom ndị a. Ka ha bụrụ ndị a kpọkwasịrị aha m na aha nna m ha Ebraham na Aịzik, ka ha mụbaa hie nne nʼelu ụwa.”
GEN 48:17 O wutere Josef mgbe ọ hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya nʼisi Ifrem. O jidere aka nna ya iwepụ ya nʼisi Ifrem, ka ọ tụkwasị ya nʼisi Manase.
GEN 48:18 Mgbe ahụ, Josef sịrị nna ya, “I bikwasịjọrọ aka gị. Onye a bụ ọkpara, bikwasị aka nri gị nʼisi ya.”
GEN 48:19 Ma nna ya jụrụ, sị ya, “Amaara m ihe m na-eme nwa m, Manase ga-aghọ oke obodo, ma nwanne ya nke nta ga-akarị ya ịdị ukwuu, nʼihi na ụmụ ụmụ ya ga-aghọ ọtụtụ mba dị iche iche.”
GEN 48:20 Ọ gọziri ha nʼụbọchị ahụ sị, “Nʼaha gị ka Izrel ga-ekwupụta ngọzị a, ‘Ka Chineke mee gị dịka Ifrem na Manase.’ ” Ya mere o buru ụzọ kpọọ Ifrem tupu Manase.
GEN 48:21 Mgbe ahụ, Izrel gwara Josef okwu sị ya, “Lee, mụ onwe m na-aga ịnwụ. Ma Chineke ga-anọnyere unu, kpọghachikwa unu azụ nʼala nna unu ha.
GEN 48:22 Mụ onwe m na-enye gị otu akụkụ ugwu karịa nke ụmụnne gị, bụ ala ugwu ahụ m sitere na mma agha m na ụta m napụta ndị Amọrait ka ọ bụrụ nke gị.”
GEN 49:1 Mgbe ahụ, Jekọb kpọkọtara ụmụ ya ndị ikom niile nʼotu sị ha, “Zukọọnụ ka m gwa unu ihe ga-adakwasị unu nʼụbọchị dị nʼihu.
GEN 49:2 “Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb nụrụ okwu nna unu Izrel.
GEN 49:3 “Ruben, ọkpara m ka ị bụ, ume m, ihe ngosi mbụ nke ike m, onye nsọpụrụ kwesiri, onye mbụ nʼịdị ike.
GEN 49:4 Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ, nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị, i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya.
GEN 49:5 “Simiọn na Livayị bụ ụmụnne. Mma agha ha bụ ngwa ihe ike.
GEN 49:6 Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha, ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha, nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha, bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche.
GEN 49:7 Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ. Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke. Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel.
GEN 49:8 “Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị. Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị. Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị.
GEN 49:9 Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda, i si nʼịchụ nta lọta, nwa m. Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala, dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya?
GEN 49:10 Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya, maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ, tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa, irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya.
GEN 49:11 Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị, nʼalaka kachasị mma ka ọ ga-ekenye nwa ịnyịnya ibu ya. Ọ ga-asakwa uwe ya na mmanya. Uwe mwụda ya ka ọ ga-asụkwa nʼọbara mkpụrụ vaịnị.
GEN 49:12 Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị. Eze ya ga-enwupụkwa ọcha karịa mmiri ara ehi.
GEN 49:13 “Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri. Ọ ga-abụ ebe izuike nye ụgbọ mmiri. Oke ala ya ga-agbatịpụ ruo Saịdọn.
GEN 49:14 “Isaka dị ike dịka ịnyịnya ibu na-amakpu nʼetiti ọgba atụrụ.
GEN 49:15 Mgbe ọ hụrụ otu ebe izuike ya si dị mma, hụ otu ala ya si maa mma, ọ ga-ehudata isi ya ibu ibu arụ; were onwe ya nye ịrụ ọrụ ike.
GEN 49:16 “Dan ga-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị ya aka dịka otu nʼime ebo Izrel.
GEN 49:17 Dan ga-adị ka agwọ dị nʼakụkụ okporoụzọ, dịka ajụala dị nʼụzọ ọhịa, nke na-ata ịnyịnya nʼikiri ụkwụ, si otu a mee ka onye na-agba ịnyịnya dalaa azụ.
GEN 49:18 “O Onyenwe anyị, ana m ele anya nnapụta gị.
GEN 49:19 “Gad bụ onye usuu ndị o-ji-egbe-aga ga-abịakwasị, ma ọ ga-alụso ha ọgụ, chụọkwa ha ọsọ.
GEN 49:20 “Asha ga-esi nʼubi ya wepụta nri gbara abụba, nke na-adị ndị eze mma.
GEN 49:21 “Naftalị dịka nne ele a hapụrụ ahapụ, nke na-amụpụta ụmụ ele mara mma.
GEN 49:22 “Dịka osisi vaịnị a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke alaka ya na-awasa rigoro nʼelu mgbidi, na nke na-amị ezi mkpụrụ, otu a ka Josef dị.
GEN 49:23 Ndị na-agbata ụta sitere nʼobi ilu lụso ya agha, ha gbara ya àkụ site nʼịkpọ asị.
GEN 49:24 Ma aka o ji jide ụta nke ya adaghị mba, ike agwụghị ogwe aka ya, nʼihi aka Onye dị ike nke Jekọb, nʼihi Onye ọzụzụ atụrụ, Oke Nkume Izrel,
GEN 49:25 nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka, nʼihi Onye pụrụ ime ihe niile, ka ọ gọzie gị, site na ngọzị nke eluigwe site nʼelu, ngọzị nke osimiri dị nʼokpuru ala, ngọzị nke ara na akpanwa.
GEN 49:26 Ngọzị niile nke nna gị, dị ukwu karịa, ngọzị niile nke ugwu ukwu mgbe ochie, karịakwa ngọzị nke ugwu nta mgbe ochie, Ka ngọzị ndị a dị iche dịkwasị nʼisi Josef, dịkwasị nʼegedege ihu Josef, onye bụ onyendu nʼetiti ụmụnne ya.
GEN 49:27 “Benjamin dịka nkịta ọhịa nke na-adọgbu anụ. Nʼụtụtụ, ọ na-eri anụ ọ dọgburu. Nʼanyasị ọ na-ekesakwa ihe o gbutere.”
GEN 49:28 Ndị a bụ ebo iri na abụọ dị nʼIzrel. Ihe ndị a bụkwa ihe nna ha gwara ha mgbe ọ gọziri ha, nye onye ọbụla nʼime ha ngọzị nke ruuru ya.
GEN 49:29 Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het.
GEN 49:30 Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu.
GEN 49:31 Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa.
GEN 49:32 Ebraham nna nna m zụrụ ala ahụ na ọgba dị nʼime ya site nʼaka ụmụ Het.”
GEN 49:33 Mgbe Jekọb kwuchara okwu ndụmọdụ ikpeazụ ndị a nye ụmụ ya ndị ikom, ọ chịkọtara ụkwụ ya nʼelu akwa, kuo ume ikpeazụ. A chịkọtara ya na ndị ya.
GEN 50:1 Josef dakwasịrị nʼihu nna ya, kwaa akwa, sutukwa ya ọnụ.
GEN 50:2 Josef nyere iwu, ka ndị dibịa na-ejere ya ozi gbasie ozu nna ya. Ya mere, ndị dibịa ahụ gbasikwara Izrel.
GEN 50:3 O were ha iri ụbọchị anọ ịgbasi ozu, nʼihi na nke a bụ oge o kwesiri iwe ha ime ya. Mgbe nke a gasịrị, a kwara ya nʼala Ijipt iri ụbọchị asaa.
GEN 50:4 Mgbe oge iru ụjụ gafesịrị, Josef gwara ndị ụlọ Fero sị ha, “Ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu unu, biko, gwaranụ m Fero otu a, sị ya,
GEN 50:5 ‘Nna m mere ka m ṅụọra ya iyi mgbe ọ na-anwụ, sị, “Lee, agala m ịnwụ, ị ga-eli m nʼili m, nke m gwuuru onwe m nʼala Kenan.” Ugbu a, biko ka m gaa lie nna m, ma lọghachikwa.’ ”
GEN 50:6 Fero zara sị ya, “Gaa lie nna gị dịka o mere ka ị ṅụọ iyi na ị ga-eme.”
GEN 50:7 Ya mere, Josef gara ili nna ya. Ọtụtụ ndị mmadụ sokwa ya. Ndịisi ọchịchị Fero, na ndị okenye ụlọ ya, na ndị okenye a ma ama nʼala Ijipt.
GEN 50:8 Ndị ọzọ bụkwa ndị ụlọ Josef niile, ụmụnne ya, na ndị ụlọ nna ya. Naanị ụmụntakịrị, na igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, ka ha hapụrụ nʼala Goshen.
GEN 50:9 Ma ịnyịnya ụgbọ na ndị na-agba ịnyịnya, so ya gaa. Igwe mmadụ gara ije a buru ibu nke ukwuu.
GEN 50:10 Mgbe ha ruru ebe ịzọcha ọka nke Atad, nʼofe ọzọ nke Jọdan, ha weere iti aka nʼobi dị ukwuu tie aka nʼobi ha nʼebe ahụ. Josef ruru ụjụ ụbọchị asaa maka nna ya nʼebe ahụ.
GEN 50:11 Mgbe ndị bi nʼala Kenan hụrụ oke iru ụjụ nke ebe ịzọcha ọka nke Atad ahụ, ha sịrị, “Nke a bụụrụ ndị Ijipt iru ụjụ dị ukwuu.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ dị nso na Jọdan Ebel-Mizraim.
GEN 50:12 Ụmụ Jekọb mere dịka nna ha gwara ha.
GEN 50:13 Nʼihi na ha buuru ozu ya laa nʼala Kenan, lie ya nʼọgba ahụ dị nʼọhịa Makipela, nke bụ ala ubi Ebraham zụrụ dịka ala olili ozu, site nʼaka Efrọn, onye Het; nʼakụkụ Mamre.
GEN 50:14 Emesịa, Josef laghachiri Ijipt ya na ụmụnne ya, na ndị niile sooro ya gaa olili ozu nna ya, ngwangwa elichara nna ya.
GEN 50:15 Mgbe ụmụnne Josef hụrụ na nna ha anwụọla, ha sịrị, “Eleghị anya Josef ga-akpọ anyị asị, kwụghachi anyị ụgwọ ihe ọjọọ niile anyị mere ya?”
GEN 50:16 Nʼihi nke a, ha zipụrụ Josef ozi sị, “Nna gị nyere iwu a tupu ọ nwụọ.
GEN 50:17 ‘Gwa Josef sị ya, Arịọọ m gị, gbaghara ihe ọjọọ niile ụmụnne gị mere, na mmehie ha mere megide gị.’ Ugbu a, gbaghara mmehie anyị bụ ndị ohu Chineke nna gị.” Mgbe Josef nụrụ ihe ha kwuru, ọ kwara akwa.
GEN 50:18 Ụmụnne ya bịakwara daa nʼihu ya, sị, “Anyị bụ ndị ohu gị.”
GEN 50:19 Ma Josef sịrị ha, “Unu atụla egwu. Abụ m Chineke onye na-ekpe ikpe nke m ga-eji taa unu ahụhụ?
GEN 50:20 Ọ bụ ezie na unu chere ime m ihe ọjọọ, ma Chineke chere ya ka ọ bụrụ ezi ihe, iji debe ọtụtụ ndụ dịka ọ na-eme taa.
GEN 50:21 Ya mere, ụjọ atụla unu. Mụ onwe m ga-azụ unu na ụmụntakịrị unu.” Ọ kasịrị ha obi, gwa ha okwu bara ha nʼobi.
GEN 50:22 Josef biri nʼIjipt, ya na ụmụnne ya, na ndị ụlọ ha. Josef gbara narị afọ na iri.
GEN 50:23 Josef hụrụ ụmụ Ifrem, na ụmụ ụmụ ya. Ọ nọkwa ndụ hụ ụmụ Makia nwa Manase, ndị e kukwasịrị nʼikpere ya.
GEN 50:24 Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Agala m ịnwụ, ma Chineke ga-abịa ileta unu. Ọ ga-esi nʼala a kpọpụta unu kpọgakwa unu nʼala ahụ ọ ṅụụrụ Ebraham na Aịzik na Jekọb iyi, na ọ ga-enye ha.”
GEN 50:25 Mgbe ahụ, Josef mere ka ụmụ Izrel ṅụọrọ ya iyi sị, “Mgbe Chineke bịara ileta unu, unu aghaghị ị site nʼebe a chịkọrọ ọkpụkpụ m.”
GEN 50:26 Josef nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri. Ha gbasiri ozu ya, tinye ya nʼime igbe ozu, nʼala Ijipt.
EXO 1:1 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel, ndị sooro Jekọb gaa biri nʼala Ijipt, onye ọbụla nʼime ha kpọ ezinaụlọ ya.
EXO 1:2 Ruben, Simiọn, Livayị na Juda;
EXO 1:3 Isaka, Zebụlọn na Benjamin;
EXO 1:4 Dan, na Naftalị; Gad na Asha.
EXO 1:5 Ọnụọgụgụ ụmụ Jekọb ndị sooro ya gaa biri nʼIjipt dị iri mmadụ asaa. Ma Josef nọrịị nʼIjipt.
EXO 1:6 Emesịa, Josef na ụmụnne ya niile nwụrụ, ma ọgbọ ahụ niile nwụkwara.
EXO 1:7 Ma ihe gaara ụmụ ụmụ Izrel nke ọma, ha mụbara, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụta ala ahụ niile.
EXO 1:8 Ma mgbe eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị ọchịchị nʼala Ijipt,
EXO 1:9 ọ sịrị ndị ya, “Lee, ndị Izrel abaala ụba nke ukwuu nʼọnụọgụgụ dịkwa ike karịa anyị.
EXO 1:10 Ngwanụ, ka anyị were amamihe meso ha mmeso ọjọọ, ma ọ bụghị otu a, ha ga-amụba karịa, mgbe agha ga-adapụta nʼetiti anyị na ndị iro anyị, ha ga-esoro ndị iro anyị lụso anyị agha, site nʼala a gbapụ.”
EXO 1:11 Nʼihi nke a, ha tinyere ndịisi ohu ga na eledo ha, bụ ndị ga-eji ọrụ mmanye kpagbuo ha. Ha wuuru Fero obodo Payitọm na Ramesis, ebe ọ na-echekwa ihe.
EXO 1:12 Ma dịka a na-ata ụmụ Izrel ahụhụ na-eleghị anya nʼazụ, otu a kwa ka ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba nʼọnụọgụgụ na-agbasakwa. Nke a mere ka ndị Ijipt tụọ ndị Izrel egwu.
EXO 1:13 Ha ji oke ọrụ mekpaa ụmụ Izrel ahụ nke ukwuu,
EXO 1:14 mee ka ndụ ụmụ Izrel bụrụ ndụ jupụtara nʼihe ilu. Ha nyere ha ọrụ ike nke ịkpụ brik na ụrọ, tinyere ọrụ dị iche iche nʼubi ha. Nʼime ọrụ niile ha na-arụ, ndị Ijipt mesiri ha ike nke ukwuu.
EXO 1:15 Mgbe ahụ kwa, eze Ijipt gwara ndị inyom Hibru na-aghọ nwa, ndị aha ha bụ Shifra na Pua sị,
EXO 1:16 “Mgbe ọbụla unu na-aghọ nwa ndị inyom Hibru, unu lezie anya nʼokwute e ji amụ nwa, ọ bụrụ nwoke, gbuonụ ya, ma ọ bụrụkwanụ nwanyị, hapụnụ ya ka ọ dịrị ndụ.”
EXO 1:17 Ma ndị inyom ndị a na-aghọ nwa emeghị ihe eze Ijipt gwara ha, nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke. Kama ha hapụrụ ụmụ ndị ikom ndị a ndụ.
EXO 1:18 Emesịa, eze Ijipt kpọrọ ndị inyom abụọ ahụ jụọ ha sị, “Gịnị mere unu ji nupu isi nʼiwu m nyere unu site nʼịhapụ igbu ụmụntakịrị ndị ikom Hibru a mụrụ, dịka m gwara unu?”
EXO 1:19 Ndị inyom ahụ zara Fero sị, “Ndị inyom Hibru na-adị ike karịa ndị inyom Ijipt nʼịmụ nwa. Ha na-amụpụtacharị ụmụ ha tupu anyị erute.”
EXO 1:20 Ya mere, Chineke gọziri ndị inyom ndị ahụ na-aghọ nwa. Ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba, ghọọ mba dị ukwuu.
EXO 1:21 Chineke nʼonwe ya, nyekwara ndị inyom ahụ na-aghọ nwa ezinaụlọ nke aka ha nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke.
EXO 1:22 Mgbe ahụ, Fero nyere ndị ya niile iwu a, “A ga-atụnye ụmụntakịrị ndị ikom Hibru niile a mụrụ ọhụrụ nʼime osimiri Naịl, ma a ga-edebe ụmụntakịrị ọhụrụ bụ ndị inyom ndụ.”
EXO 2:1 Nʼoge a, otu nwoke onye Hibru si nʼebo Livayị, gakwara lụọ otu nwaada onye Livayị.
EXO 2:2 Nwanyị a tụụrụ ime, mụọ otu nwa nwoke. Mgbe ọ hụrụ na nwa ọhụrụ ahụ mara mma, o zoro ya nʼụlọ ọnwa atọ.
EXO 2:3 Mgbe ọ na-enweghịkwa ike izo nwantakịrị a gaa nʼihu, o jiri ahịhịa papịrọs kpaa nkata, were korota tee nʼahụ nkata ahụ niile igbochi mmiri ịbata nʼime ya. O kunyere nwantakịrị ahụ nʼime ya buru nkata ahụ debe ya nʼakụkụ osimiri Naịl ebe ahịhịa mmiri na-eto.
EXO 2:4 Nwanne nwantakịrị ahụ, nke nwanyị, gakwara guzo nʼebe dị anya na-eche nwantakịrị ahụ nche, ịhụ ihe ga-eme ya.
EXO 2:5 Ọ dịghị anya, ada Fero bịara nʼakụkụ osimiri Naịl ahụ ịsa ahụ. Mgbe ọ nọ na-asa ahụ, ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi malitere ịgagharị nʼakụkụ osimiri Naịl. Ma ada Fero lepụrụ anya hụ nkata ahụ nʼetiti riidi, zie otu nʼime ohu ya nwanyị ka ọ gaa bute ya.
EXO 2:6 Mgbe o bupụtara ya, meghee ya, ada Fero hụrụ nwantakịrị ahụ ka ọ na-akwa akwa. O nwere ọmịiko nʼebe nwantakịrị ahụ nọ. Ọ sịrị, “Nwatakịrị a ga-abụrịrị otu nʼime ụmụ ndị Hibru.”
EXO 2:7 Mgbe ahụ, nwanne nwanyị nwantakịrị a jụrụ ada Fero sị, “Ọ bụ m gaa chọọrọ gị otu nwanyị nʼime ndị inyom Hibru ka ọ na-elekọtaara gị nwantakịrị a anya?”
EXO 2:8 Ada Fero zaghachiri sị, “Ee, gaa mee otu ahụ.” Nwaagbọghọ ahụ gara ngwangwa nʼụlọ ha kpọọ nne nwantakịrị ahụ.
EXO 2:9 Mgbe ha bịaghachiri, ada Fero gwara nne nwantakịrị ahụ sị ya, “Kuru nwantakịrị a, gaa zụpụtara m ya. Aga m akwụ gị ụgwọ nke ọma.” Ya mere, nwanyị ahụ kuuru nwantakịrị ahụ, gaa zụọ ya.
EXO 2:10 Mgbe nwantakịrị ahụ tolitere, nne ya kulaara ya ada Fero, ka ọ bụrụ nwa ada Fero. Aha ada Fero gụrụ ya bụ Mosis, nʼihi ọ sịrị, “Esi m na mmiri gụpụta ya.”
EXO 2:11 Otu ụbọchị, mgbe Mosis toro, ọ pụrụ gaa nʼebe ụmụnna ya nọ, ilele ha mgbe ha nọ na-arụ ọrụ ike ha. Ọ hụrụ otu onye Ijipt ka ọ na-eti onye Hibru ihe, bụ otu nʼime ụmụnna ya.
EXO 2:12 Mosis lere anya nʼakụkụ abụọ. Mgbe ọ hụrụ na ọ dịghị onye na-ele ya anya, o gburu onye Ijipt ahụ, lie ya nʼime aja.
EXO 2:13 Nʼechi ya, Mosis pụrụ hụ ndị Hibru abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Mosis jụrụ onye nke ikpe mara ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-eti nwanna gị ihe?”
EXO 2:14 Ma onye ahụ jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị? Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ahụ?” Mgbe ahụ Mosis tụrụ ụjọ. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Ndị mmadụ amatala banyere ihe ahụ m mere.”
EXO 2:15 Mgbe Fero nụrụ ihe Mosis mere, ọ gbalịrị igbu Mosis. Ma Mosis si nʼihu Fero gbapụ ọsọ gbaga ala Midia. Nʼebe ahụ ọ gara nọdụ ala nʼakụkụ olulu mmiri.
EXO 2:16 Ma o nwere otu onye nchụaja obodo Midia mụtara ụmụ agbọghọ asaa. Nʼoge a, ha bịara iseta mmiri na ịgbanye ya nʼime ihe ịgbanye mmiri anụ ụlọ maka inye igwe anụ ụlọ nna ha mmiri.
EXO 2:17 Ma ụfọdụ ndị na-azụ atụrụ bịara chụpụ ha. Mosis biliri ọtọ, bịa napụta ha, nyere ha aka nye igwe anụ ụlọ ha mmiri.
EXO 2:18 Ha lọghachikwutere nna ha, Reuel, onye jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọta nʼoge taa?”
EXO 2:19 Ha zara nna ha sị, “Otu onye Ijipt napụtara anyị site nʼaka ndị ọzụzụ atụrụ. O setaara anyị mmiri, nyekwa igwe anụ ụlọ anyị mmiri.”
EXO 2:20 Nna ha jụrụ ha sị, “Olee ebe ọ nọ? Gịnị mere unu ji hapụ ya nʼebe ahụ? Gaanụ kpọọ ya ka o soro anyị rie nri.”
EXO 2:21 Mosis nabatara oku ahụ Reuel kpọrọ ya ka ha na ya biri. O sokwara ha biri. Reuel kpọnyere Mosis Zipọra, otu nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya.
EXO 2:22 Zipọra mụtara nwa nwoke, onye Mosis kpọrọ aha ya Geshọm. Nʼihi na Mosis sịrị, “Abụ m onye ọbịa nʼala ndị ọzọ.”
EXO 2:23 O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Fero eze Ijipt nwụrụ. Nʼoge a, ụmụ Izrel nọ na-asụ ude nʼime ọnọdụ ịbụ ohu ha. Ha kwara akwa nke ukwuu. Akwa ha kwara ka e nyere ha aka nʼihi ọnọdụ ịbụ ohu ha ruru Chineke ntị.
EXO 2:24 Chineke nụrụ ịsụ ude ha. O chetara ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebraham, na Aịzik, na Jekọb gbara.
EXO 2:25 Chineke hụrụ ụmụ Izrel, ihe banyere ha metukwara ya nʼobi.
EXO 3:1 Nʼoge a, Mosis na-azụ igwe anụ ụlọ Jetro ọgọ ya nwoke, onye nchụaja na Midia. Otu ụbọchị, o duuru igwe anụ ụlọ ndị a gaa nʼakụkụ ọzara. Ọ batara Horeb, ugwu Chineke.
EXO 3:2 Nʼebe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọkụ na-ere nʼetiti ọhịa. Mosis hụrụ na ọ bụ ezie na ọhịa ahụ na-enwu ọkụ ma ọ naghị ere ọkụ.
EXO 3:3 Nʼihi ya, Mosis chere nʼobi ya sị, “Aga m aga nso leruo ihe omimi a anya, otu ọkụ si enwu ma ọhịa anaghị ere ọkụ.”
EXO 3:4 Mgbe Onyenwe anyị hụrụ na ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, Chineke kpọrọ ya oku site nʼime ọhịa ahụ, “Mosis! Mosis!” Ọ sị, “Lekwa m nʼebe a.”
EXO 3:5 Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Abịakwala nso. Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.”
EXO 3:6 Ọ sịrị, “Abụ m Chineke nke nna gị. Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.” Mosis zoro ihu ya, nʼihi na ọ tụrụ egwu ilegide Chineke anya.
EXO 3:7 Mgbe ahụ Onyenwe anyị sịrị, “Nʼezie, ahụla m nhụju anya nke ndị m nọ nʼIjipt, anụkwala m mkpu akwa ha, nʼihi aka ike nke ndị na-achị ha dịka ndị ohu. Nʼihi na ama m ahụhụ ha na-agabiga.
EXO 3:8 Ya mere, agbadatala m ịnapụta ha site nʼaka ndị Ijipt na ịkpọpụta ha site nʼala ahụ, idubata ha nʼala ọma ahụ, nke sara mbara, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ala ebe ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi.
EXO 3:9 Ugbu a, akwa ụmụ Izrel eruola m ntị, ahụkwala m otu ndị Ijipt si na-emegbu ha.
EXO 3:10 Ugbu a, aga m eziga gị ka i jekwuru Fero, ka i dupụta ndị m bụ ụmụ Izrel site nʼala Ijipt.”
EXO 3:11 Mosis sịrị Chineke, “Onye ka m bụ na m ga-ejekwuru Fero, meekwa ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụta?”
EXO 3:12 Chineke gwara ya sị, “Aga m anọnyere gị. Nke a ga-abụ ihe ama nye gị na ọ bụ m na-eziga gị. Mgbe i sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel, unu niile ga-efe m ofufe nʼelu ugwu a.”
EXO 3:13 Ma Mosis jụrụ Chineke sị, “Ọ bụrụ na m agwa ụmụ Izrel sị, ‘Chineke nna nna unu zitere m izi unu ozi,’ ha ga-ajụ m sị, ‘Gịnị bụ aha ya?’ Gịnị ka m ga-aza ha?”
EXO 3:14 Chineke sịrị Mosis, “ABỤ M ONYE M BỤ. Naanị gwa ụmụ Izrel na ‘ABỤ M zitere gị.’ ”
EXO 3:15 Chineke gakwara nʼihu gwa Mosis sị, Si otu a gwa ụmụ Izrel okwu. “Onyenwe anyị, Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb, zitere m ịbịakwute unu.” Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, aha nke e ji echeta m site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
EXO 3:16 “Gaa, kpọkọta ndị okenye Izrel niile zie ha sị, ‘Onyenwe anyị Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb, egosila m onwe ya, sị m, Eleruola m ọnọdụ unu anya hụ ihe a na-eme unu nʼala Ijipt.
EXO 3:17 Ekweela m nkwa ịkpọpụta unu site nʼahụhụ unu na-ahụ nʼala Ijipt duru unu baa nʼala nke ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi nʼime ya. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’
EXO 3:18 “Ndị okenye Izrel ga-anabata ozi gị. Mgbe ahụ gị na ha ga-eso gaa nʼihu eze Ijipt gwa ya sị, ‘Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru ezutela anyị. Kwere ka anyị gaa njem nʼime ọzara abalị atọ gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja.’
EXO 3:19 Amaara m rịị na eze Ijipt agaghị ekwe ka unu gaa, tutu ruo mgbe e ji aka ike kwagide ya.
EXO 3:20 Ma aga m esetipụ aka m tie Ijipt ihe otiti, site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke m ga-eme nʼetiti ya. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ahapụ unu ka unu laa.
EXO 3:21 “Aga m emekwa ka unu nweta amara nʼihu ndị Ijipt, ka unu ghara ịgba aka mgbe unu na-ala.
EXO 3:22 Nwanyị ọbụla ga-arịọ site nʼaka nwanyị Ijipt onye agbataobi ya na nwanyị ọbịa bi nʼụlọ ya, ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na akwa dị iche iche. Unu ga-eyikwasị ha ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom, bịa si otu a kwakọrọ ngwongwo ndị Ijipt.”
EXO 4:1 Mosis zaghachiri ya sị, “Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ha agaghị ekwenye ihe m kwuru maọbụ ajụ ige m ntị? Ọ bụrụ na ha asị, ‘Onyenwe anyị egosighị gị onwe ya.’ ”
EXO 4:2 Ma Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Gịnị ka i ji nʼaka?” Mosis zara sị, “Ọ bụ mkpanaka.”
EXO 4:3 Onyenwe anyị sịrị ya, “Tụpụ ya nʼala.” Mosis tụpụrụ ya nʼala. Ma otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ agwọ. Mosis sitere nʼebe agwọ ahụ nọ gbapụ ọsọ.
EXO 4:4 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị ya, “Jide agwọ ahụ aka nʼọdụdụ ya.” Mgbe Mosis mere nke a, agwọ ahụ ghọghachikwara mkpanaka.
EXO 4:5 Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Ọ bụrụ na i mee ihe ịrịbama a, ha ga-ekwere ihe ị gwara ha. Ha ga-aghọta na Onyenwe anyị Chineke nna nna ha, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb gosiri gị onwe ya.”
EXO 4:6 Onyenwe anyị gwara ya okwu ọzọ sị, “Tinye aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mgbe Mosis tinyere aka ya wepụta ya, ọ chọpụtara na ekpenta jupụtara nʼaka ahụ nke na-enwu ezi ọcha.
EXO 4:7 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Tinyekwa aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mosis mere otu a. Mgbe o wepụtara aka ya ọzọ, ọ hụrụ na ọ dịghachiri dịka akụkụ anụ ahụ ya ndị ọzọ.
EXO 4:8 Mgbe ahụ Onyenwe anyị sịrị, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ekweghị gị maọbụ nabata ihe ama nke mbụ, ha ga-ekwe ihe ịrịbama nke abụọ a.
EXO 4:9 Ma ọ bụrụ na ha ekwenyeghị nʼihe ịrịbama abụọ ndị a ma ọ bụkwanụ gee gị ntị; kute mmiri nʼosimiri Naịl, wụpụ ya nʼala akọrọ. Mmiri ahụ nke i kutere site nʼosimiri ga-agbanwe, ghọọ ọbara nʼala akọrọ.”
EXO 4:10 Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Biko Onyenwe m, abụghị m onye mara ekwu okwu. Ọ nwebeghị oge m ji bụrụ onye ọka okwu, na mgbe gara aga maọbụ site na mgbe ị gwara ohu gị okwu. Lee, onye nwere ire na egbugbere ọnụ dị arọ ka m bụ.”
EXO 4:11 Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere ọnụ mmadụ? Onye na-emekwa ka ntị mmadụ chie ya, maọbụ ka mmadụ daa ogbi? Onye na-eme ka mmadụ hụ ụzọ, maọbụ kpụọ ìsì? Ọ bụghị mụ onwe m bụ Onyenwe anyị?
EXO 4:12 Ugbu a, gaa mee ihe m gwara gị. Aga m enyere gị aka ikwu okwu nke ọma. Aga m agwakwa gị ihe ị ga-ekwu.”
EXO 4:13 Ma ọ rịọrọ, “Biko Onyenwe m, ziganụ onye ọzọ.”
EXO 4:14 Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Mosis sị ya, “Kedụ maka nwanne gị nwoke Erọn onye Livayị, amaara m na ọ bụ onye ọka okwu. Lee, ọ na-abịa izute gị. Ọ ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ chọtara gị.
EXO 4:15 Ị ga-agwa ya okwu, tinye okwu gị nʼọnụ ya. Aga m enyere unu abụọ aka ikwu okwu nke ọma, aga m ezikwa unu abụọ ihe unu ga-eme.
EXO 4:16 Ọ ga-abụ onye na-ekwuchite ọnụ gị nʼebe ndị mmadụ nọ. Ị ga-anọ dịka Chineke nʼebe ọ nọ, nʼihi na ị ga-agwa ya ihe niile ọ ga-ekwu.
EXO 4:17 Ma ị ga-ejide mkpanaka a dị nʼaka gị ka i nwee ike jiri ya mee ihe ịrịbama.”
EXO 4:18 Emesịa, Mosis lọghachiri nʼụlọ ebe o bi, jekwuru Jetro ọgọ ya nwoke rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m laghachi nʼIjipt gaa chọpụta ma o nwere ndị ikwu m ka dị ndụ.” Jetro sịrị, “Gaa nʼudo.”
EXO 4:19 Ugbu a Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼala Midia sị ya, “Laghachi Ijipt nʼihi na ndị niile chọrọ igbu gị anwụchaala.”
EXO 4:20 Mosis kpọọrọ nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, laghachi nʼala Ijipt. O jikwa mkpanaka Chineke ahụ nʼaka ya.
EXO 4:21 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Mgbe i ruru Ijipt, hụ na ị gara nʼihu Fero mee ihe ebube niile m nyere gị ike ime. Ma aga m eme ka obi ya sie ike, ka ọ ghara ikwe ka ndị m laa.
EXO 4:22 Ị ga-agwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Izrel bụ Ọkpara m.
EXO 4:23 Agwara m gị okwu sị, “Hapụ nwa m nwoke ka o si nʼala Ijipt pụọ gaa ebe ọ ga-anọ fee m ofufe,” ma ị jụrụ ajụ. Ugbu a aga m egbu ọkpara gị.’ ”
EXO 4:24 Mgbe Mosis na ezinaụlọ ya na-alaghachi Ijipt, ha rutere ebe ha ga-ezu ike abalị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị bịakwutere Mosis chọọ igbu ya.
EXO 4:25 Ma Zipọra nwunye Mosis weere mma ntakịrị bie nwa ya ugwu. O were ihe o bipụtara nʼugwu a metụ nʼụkwụ Mosis, kwuo sị, “Nʼezie, ị bụ di ọbara nʼebe m nọ.”
EXO 4:26 Nʼihi ya, Onyenwe anyị hapụrụ Mosis. (Mgbe ahụ, Zipọra kwuru sị, “Ị bụ di ọbara,” nʼihi obibi ugwu ahụ.)
EXO 4:27 Ugbu a, Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị, “Gaa nʼime ọzara ka izute Mosis.” Erọn gara jekwuru Mosis nʼugwu Horeb, ugwu Chineke, sutu ya ọnụ.
EXO 4:28 Mgbe ahụ Mosis gwara Erọn ihe niile Onyenwe anyị ziri ya ka o kwuo, ya na ihe ịrịbama ndị ahụ niile o nyere nʼiwu ka o mee.
EXO 4:29 Mosis na Erọn jeruru Ijipt kpọọ nzukọ ndị okenye ụmụ Izrel niile.
EXO 4:30 Erọn gwara ha ihe niile Onyenwe anyị gwara Mosis. Mosis, nʼonwe ya mere ihe ịrịbama ahụ niile nʼihu anya ha.
EXO 4:31 Mgbe ahụ, ha kwenyere; dịka ha nụrụ na Onyenwe anyị eletala ụmụ Izrel, ma hụkwa ahụhụ ha. Ha kpọrọ isiala fee ya ofufe.
EXO 5:1 Emesịa, Mosis na Erọn jekwuuru Fero guzo nʼihu ya gwa ya okwu sị, “Ihe a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m mmemme dị nsọ nʼime ọzara.’ ”
EXO 5:2 Fero zara sị, “Onye ka Onyenwe anyị bụ m ga-eji gee ntị nʼolu ya ịhapụ ụmụ Izrel ka ha si nʼebe a pụọ? Amaghị m onye ọ bụ, agaghị m ekwekwa ka Izrel gaa ebe ọbụla.”
EXO 5:3 Ha zara sị, “Chineke ndị Hibru zutere anyị. Biko kwere ka anyị gaa njem ụbọchị atọ nʼime ọzara nọọ nʼebe ahụ chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja. Ọ bụrụ na anyị ajụ ige ntị nʼolu ya, ọ ga-eji ọrịa ọjọọ maọbụ mma agha kpochapụ anyị.”
EXO 5:4 Eze Ijipt zara ha sị, “Mosis na Erọn, gịnị mere unu ji na-ewepụ ụmụ Izrel aka site nʼọrụ ha? Laghachinụ nʼọrụ unu!”
EXO 5:5 Fero gara nʼihu sị, “Lee, ka ndị obodo a si dị ọtụtụ ugbu a, ihe unu na-eme bụ naanị igbochi ha ịrụ ọrụ ha.”
EXO 5:6 Nʼụbọchị ahụ kwa, Fero nyere ndị nlekọta ụmụ Izrel na ndị o mere ndịisi nʼebe ụmụ Izrel nọ iwu sị,
EXO 5:7 “Unu enyekwala ụmụ Izrel ahịhịa ha ga-eji kpụọ brik dịka unu na-eme nʼoge gara aga. Kama, ha ga-achọta ahịhịa ahụ nʼonwe ha.
EXO 5:8 Ọzọ, meenụ ka ọnụọgụgụ brik ha na-akpụ dịrị ka ọ dị na mbụ, unu emela ka ọ dịrị ala. Ha bụ ndị umengwụ. Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, ‘Ka anyị gaa nʼọzara gaa chụọrọ Chineke anyị aja.’
EXO 5:9 Nyenụ ha ọrụ dị ike, nke ga-ezi ha na ha ekwesighị ịṅa ntị nʼokwu ụgha Mosis na Erọn na-ekwuru ha.”
EXO 5:10 Ndị na-achị ndị ohu na ndị nlekọta jekwuuru ụmụ Izrel sị ha, “Ihe a ka Fero kwuru: ‘Agaghị m enyekwa unu ahịhịa ọzọ.
EXO 5:11 Gaanụ chọtara onwe unu okporo ahịhịa ebe ọbụla unu nwere ike ịchọta ya, ma nke a agaghị eme ka e gbubilata ọrụ unu kwesiri ịrụ.’ ”
EXO 5:12 Ya mere ndị ha gbasasịrị nʼala Ijipt niile ịchịkọta okporo ahịhịa ha ji akpụ brik.
EXO 5:13 Ndị na-achị ha nọgidere na-akwagide ha sị ha, “Rụchaanụ ọrụ unu kwesiri ịrụ nʼụbọchị dịka unu si arụ ya mgbe a na-enye unu ahịhịa.”
EXO 5:14 Ndịisi ọrụ Fero malitere iti ndị Izrel ha họpụtara maka inyere ha aka ilekọta ndị ọrụ ihe, na-ajụ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu akpụtaghị oke ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụta ụnyaahụ maọbụ taa?”
EXO 5:15 Mgbe ahụ, ndịisi ọrụ ndị Izrel bịakwutere Fero kwaara ya akwa sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-emeso ndị ohu gị mmeso?
EXO 5:16 Ọ dịghị okporo ahịhịa a na-enye ndị ohu gị, ma ha na-asị anyị, ‘Kpụọnụ brik!’ A na-etikwa ndị ohu gị ihe, ma ịta ụta ekwesighị ịdịrị anyị kama ịta ụta dịrị ndị gị.”
EXO 5:17 Fero zaghachiri ha sị, “Ndị umengwụ! Nʼezie ndị umengwụ ka unu bụ. Ọ bụ ya mere unu ji nọgide na-asị, ‘Ka anyị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.’
EXO 5:18 Laghachinụ azụ ugbu a nʼọrụ unu. A gaghị enye unu okporo ahịhịa ọbụla. Ma unu ga-arụpụtarịrị ọnụọgụgụ brik dị ka a chọrọ nʼaka unu.”
EXO 5:19 Ndịisi ọrụ ụmụ Izrel ghọtara na ha nọ na nsogbu mgbe a gwara ha okwu sị ha, “Unu ga-akpụtarịrị ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụ kwa ụbọchị.”
EXO 5:20 Mgbe ha si nʼihu Fero pụọ, ha zutere Mosis na Erọn ebe ha nọ na-eche ha.
EXO 5:21 Ndị nlekọta ọrụ ndị a gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ka Onyenwe anyị lee unu anya ma kpee unu ikpe. Unu emeela ka anyị bụrụ ihe na-esi ajọ isi nʼihu Fero na ndị na-ejere ya ozi. Unu etinyela mma agha nʼaka ha nke ha ga-eji gbuo anyị.”
EXO 5:22 Mgbe ahụ Mosis laghachikwuru Onyenwe anyị jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji butere ndị a nsogbu? Gịnị mere i ji zite m?
EXO 5:23 Nʼihi na site na mgbe m jekwuuru Fero gwa ya okwu nʼaha gị, o meela ka nsogbu dakwasị ndị a, ma ị napụtabeghị ndị gị.”
EXO 6:1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero. Nʼihi ike aka m, ọ ga-ezipụ ha. Nʼihi ike aka, ọ ga-achụpụ ha site nʼala ya.”
EXO 6:2 Chineke gara nʼihu gwa Mosis sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
EXO 6:3 Egosiri m Ebraham na Aịzik na Jekọb onwe m dịka Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ma ọ dịghị mgbe m mere ka ha mata aha m dịka Onyenwe anyị.
EXO 6:4 Emere m ka ọgbụgba ndụ m guzosie ike nʼetiti mụ na ha, ọgbụgba ndụ nke inye ha ala Kenan ebe ha biri dịka ndị ọbịa.
EXO 6:5 Ugbu a, anụla m ịsụ ude ụmụ Izrel, bụ ndị ahụ ndị Ijipt mere ka ha bụrụ ndị ohu. Echetakwala m ọgbụgba ndụ m.
EXO 6:6 “Ya mere, gwa ụmụ Izrel, ‘Abụ m Onyenwe anyị. Aga m akpọpụta unu site nʼọnọdụ ịbụ ohu ndị Ijipt. Aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu nye ha. Aga m eji aka ike m nke m ga-esetipụ, ya na ihe ngosipụta dị ukwuu nke ikpe ikpe m, gbapụta unu.
EXO 6:7 Mgbe ahụ, aga m ewere unu ka unu bụrụ ndị m. Aga m abụ Chineke unu. Unu ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, onye kpọpụtara unu site nʼaka ịbụ ohu nʼala Ijipt.
EXO 6:8 Aga m akpọbata unu nʼala ahụ m weliri aka m elu, ṅụọ nʼiyi, nye Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ime ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Abụ m Onyenwe anyị.’ ”
EXO 6:9 Mosis gwara ụmụ Izrel ihe ndị a, ma ha egeghị ntị nʼihi ịda mba nke obi ha na ahụhụ sitere na ndọgbu nʼọrụ ha.
EXO 6:10 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị,
EXO 6:11 “Gaa gwa Fero eze Ijipt, ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka ha pụọ nʼala ya.”
EXO 6:12 Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Mgbe ụmụ Izrel na-aṅaghị m ntị, olee otu Fero ga-esi ṅaa m ntị? Nke ka nke, enweghị m ike ikwu okwu nke ọma.”
EXO 6:13 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu banyere ụmụ Izrel na banyere Fero eze Ijipt. O nyere ha iwu sị ha site nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.
EXO 6:14 Ndị a bụ aha ndịisi ebo Izrel niile. Ụmụ ndị ikom Ruben, ọkpara Izrel bụ, Hanok na Palu, Hezrọn na Kami. Ndị a bụ agbụrụ Ruben.
EXO 6:15 Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ, Jemuel, Jamin, Ohad, Jakin, Zoha na Shaul (onye nne ya bụ onye Kenan). Ndị a bụ agbụrụ Simiọn.
EXO 6:16 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Livayị nʼusoro e si mụọ ha: Geshọn, Kohat na Merari. Livayị nʼonwe ya gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
EXO 6:17 Ụmụ ndị ikom Geshọn, nʼagbụrụ ha, bụ Libni na Shimei, nʼusoro ezinaụlọ ha.
EXO 6:18 Ụmụ ndị ikom Kohat bụ, Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Kohat gbara narị afọ na iri afọ atọ na atọ mgbe ọ nwụrụ.
EXO 6:19 Ụmụ ndị ikom Merari bụ Mahali na Mushi. Ndị a niile si nʼagbụrụ Livayị, dịka ihe e dere banyere ha si dị.
EXO 6:20 Amram lụrụ Jokebed, nwanne nna ya. Erọn na Mosis bụ ụmụ ha ndị ikom. Ma Amram gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
EXO 6:21 Ụmụ ndị ikom Izha bụ Kora, Nefeg na Zikri.
EXO 6:22 Ụmụ ndị ikom Uziel bụ, Mishael, Elzafan na Sitri.
EXO 6:23 Erọn lụrụ Elisheba, nwa Aminadab, na nwanne nwanyị Nashọn. Ụmụ ha bụ, Nadab, na Abihu, Elieza na Itama.
EXO 6:24 Ụmụ ndị ikom Kora bụ, Asịa, Elkena na Abiasaf. Ndị a bụ ndị ikwu Kora.
EXO 6:25 Elieza, nwa Erọn lụrụ otu nʼime ụmụ Putiel, onye mụtaara ya Finehaz. Ndị a bụ aha ndịisi ezinaụlọ Livayị dịka ikwu ha si dị.
EXO 6:26 Ọ bụkwa Mosis na Erọn ka Onyenwe anyị gwara okwu sị, “Sitenụ nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel dịka ọnụọgụgụ ha si dị.”
EXO 6:27 Ha bụ ndị gwara Fero, eze Ijipt okwu banyere ime ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụọ. Ọ bụkwa otu Mosis na Erọn ahụ.
EXO 6:28 Otu ụbọchị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼIjipt,
EXO 6:29 ọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, gaa gwa Fero eze Ijipt ihe niile m gwara gị.”
EXO 6:30 Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Lee, abụ m onye na-adịghị ekwuzi okwu nke ọma, gịnị mere Fero ga-eji gee ntị nʼihe m ga-agwa ya?”
EXO 7:1 Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Emeela m gị ka ị dịrị ka Chineke nʼebe Fero nọ. Nwanne gị Erọn ga-abụkwa onye amụma gị.
EXO 7:2 Ị ga-agwa Erọn ihe niile m gwara gị. Ọ ga-ekwukwa ha nʼihu Fero, rịọọ ya ka o kwere ka ụmụ Izrel hapụ ala Ijipt.
EXO 7:3 Ma aga m eme ka obi Fero sie ike. Ọ bụ ezie na m ga-eme ọtụtụ ihe ịrịbama nʼihe ebube nʼala Ijipt,
EXO 7:4 ma Fero agaghị ege unu ntị. Mgbe ahụ aga m eme ka aka m bịakwasị Ijipt. Aga m esite nʼoke ọrụ nke ikpe ọmụma dị oke egwu, mee ka ndị m, Izrel, dịka usuu ha niile si dị, site nʼala Ijipt pụọ.
EXO 7:5 Ndị Ijipt ga-amata nʼezie na m bụ Onyenwe anyị, mgbe m setịpụrụ aka nʼIjipt, ma site nʼetiti ha kpọpụta ụmụ Izrel.”
EXO 7:6 Mosis na Erọn mere dịka Onyenwe anyị nyere ha iwu.
EXO 7:7 Nʼoge a, mgbe ha gwara Fero okwu, Mosis agbaala iri afọ asatọ. Ma Erọn agbaala iri afọ asatọ na atọ.
EXO 7:8 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị,
EXO 7:9 “Mgbe Fero ga-agwa unu okwu sị, ‘Meenụ ihe ebube.’ Ị ga-agwa Erọn okwu sị ya, ‘Were mkpanaka gị tụpụ ya nʼala nʼihu Fero.’ Ọ ga-aghọ agwọ.”
EXO 7:10 Mgbe ahụ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero mee dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu. Erọn tụpụrụ mkpanaka ya nʼala nʼihu Fero na ndị ozi ya. Ọ ghọrọ agwọ.
EXO 7:11 Ma Fero kpọkọtara ndị maara ihe, na ndị mgbaasị, na ndị majiki nọ nʼIjipt. Ha bịara mee ụdị ihe ịrịbama ahụ Mosis na Erọn mere site nʼihe nzuzo nke akaọrụ ha.
EXO 7:12 Onye ọbụla nʼime ha tụpụrụ mkpanaka ya, nke ghọkwara agwọ. Ma mkpanaka ahụ Erọn tụpụrụ, nke ghọrọ agwọ, loro mkpanaka ndị ahụ niile ndị Ijipt tụpụrụ.
EXO 7:13 Fero nyịchiri obi ya, mee ka o sie ike. O geghị Erọn na Mosis ntị dịka Onyenwe anyị kwuru.
EXO 7:14 Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Obi Fero siri ike. Ọ bụ nke a mere o ji na-aga nʼihu na-ajụ ka ndị m laa.
EXO 7:15 Ma otu ọ dị; nʼisi ụtụtụ echi, jekwuru Fero tupu ọ gaa nʼosimiri. Guzoro nʼakụkụ osimiri Naịl, jidekwa mkpanaka ahụ ghọrọ agwọ nʼaka gị.
EXO 7:16 Ị ga-agwa Fero sị, ‘Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru, ezitela m ka m gwa gị sị, hapụ ndị m ka ha gaa nʼọzara fee m ofufe. Tutu ruo ugbu a, ị jụrụ ige ntị.’
EXO 7:17 Ugbu a Onyenwe anyị kwuru nke a sị, ‘Ị ga-amata site na nke a na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. Aga m ewere mkpanaka a nke m ji nʼaka tie nʼosimiri Naịl. Ọ ga-agbanwe ghọọ ọbara.
EXO 7:18 Azụ niile dị nʼime ya ga-anwụ. Osimiri ahụ ga-esikwa isi dịka ihe rere ure. Nke a ga-eme ka ọ bụrụ ihe rara ahụ nye ndị Ijipt ịṅụ mmiri site na ya.’ ”
EXO 7:19 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn ka o setịpụ mkpanaka ya nʼelu mmiri niile dị nʼIjipt. Nke a metụtara osimiri ha niile, mmiri ntakịrị ha niile, ọdọ mmiri ha niile, na ebe niile ha na-echekọta mmiri. Ọbara ga-ejupụta ebe niile nʼIjipt, ite mmiri na ite aja na ite osisi niile.”
EXO 7:20 Mosis na Erọn mere dị ka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu ime. Nʼihu Fero na ndịisi ọrụ ya, Erọn weliri mkpanaka ya tie ya nʼelu mmiri dị nʼosimiri Naịl. Nʼotu ntabi anya, mmiri ahụ gbanwere ghọọ ọbara.
EXO 7:21 Ka azụ dị nʼime mmiri Naịl nwụsịrị, mmiri ahụ malitere na-esi isi ọjọọ, nke mere ka ndị Ijipt hapụ inwe ike ịṅụ mmiri sitere na ya. Ọbara jupụtakwara nʼala Ijipt niile.
EXO 7:22 Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ka mmiri chaa ọbara ọbara. Nke a mere ka Fero nyịchie obi ya. Ọ ṅaghị Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị gwara ha na ọ ga-eme.
EXO 7:23 Fero tụgharịrị laghachi nʼụlọeze ya, na-echeghị echiche banyere ihe niile ahụ e mere.
EXO 7:24 Ya mere, ndị Ijipt niile gwuru olulu mmiri nʼakụkụ osimiri ahụ ịchọ mmiri ọṅụṅụ ebe ha na-enweghị ike ịṅụ mmiri sitere nʼosimiri Naịl.
EXO 7:25 Ụbọchị asaa gasịrị, site nʼụbọchị Onyenwe anyị tichara ihe otiti ahụ na Naịl.
EXO 8:1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Jekwuru Fero gwa ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru. Hapụ ndị m, ka ha gaa fee m ofufe.
EXO 8:2 Ọ bụrụ na ị jụ ịhapụ ha ka ha gaa, aga m eme ka awọ jupụta nʼala Ijipt niile.
EXO 8:3 Osimiri Naịl ga-ejupụta nʼawọ. Ha ga-abata nʼụlọeze gị na nʼime ọnụụlọ ndina gị, ma nʼelu ihe ndina gị, ma nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, ma nʼụlọ ndị gị niile, na nʼebe a na-esi nri, ma nʼime ihe e ji agwakọta ụtụ ọka.
EXO 8:4 Awọ ndị a ga-arịgokwa nʼahụ gị, na nʼahụ ndị gị, na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi.’ ”
EXO 8:5 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Gwa Erọn, ‘Setịpụ aka gị ya na mkpanaka gị nʼelu osimiri niile, na mmiri nta na ọdọ mmiri ndị Ijipt, mee ka awọ jupụta ala Ijipt niile.’ ”
EXO 8:6 Erọn setịpụrụ aka nʼelu mmiri niile nke Ijipt, awọ pụtara kpuchie ala ahụ niile.
EXO 8:7 Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ihe ahụ Mosis na Erọn mere. Ha mekwara ka awọ jupụta ala ahụ niile.
EXO 8:8 Fero kpọrọ Mosis na Erọn rịọọ ha sị, “Rịọọnụ Onyenwe anyị ka o wepụrụ mụ na ndị m awọ ndị a. Emesịa aga m ekwe ka ndị gị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.”
EXO 8:9 Mosis zaghachiri Fero sị, “Gị ka ọ dịrị ịgwa m mgbe m ga-arịọ arịrịọ a nʼisi gị na nʼisi ndị gị, ka e wezuga awọ ndị a site nʼụlọ unu, ma hapụ naanị ndị nọ nʼosimiri Naịl.”
EXO 8:10 Mgbe ahụ Fero sịrị Mosis, “Achọrọ m ka i mee ya echi.” Mosis zaghachiri Fero sị, “Ọ dị mma, ka ọ dịrị dịka i kwuru. Mgbe ahụ, ị ga-amata na o nweghị onye dịka Onyenwe anyị Chineke anyị.
EXO 8:11 Awọ ndị a niile ga-apụ site nʼebe ị nọ, na site nʼụlọ gị na site nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi na site nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ọ bụ naanị nʼosimiri Naịl ka ha ga-anọ.”
EXO 8:12 Mgbe Mosis na Erọn sitere nʼụlọ Fero pụọ, Mosis kpọkuru Onyenwe anyị ka o wepụ awọ ndị a o mere ka ha bịakwasị Fero.
EXO 8:13 Onyenwe anyị mere ihe Mosis rịọrọ. Awọ ndị ahụ niile nwụrụ nʼime ụlọ, na nʼama, na nʼọhịa.
EXO 8:14 E kpokọtara ozu awọ ndị a niile nʼebe dị iche iche. Isi ọjọọ ha wetara nʼala ahụ dị egwu.
EXO 8:15 Ma mgbe Fero hụrụ na awọ ndị a anwụchaala, o mechiri obi ya jụ ige Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme.
EXO 8:16 Ya mere, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn, setịpụ mkpanaka gị, tie nʼaja nke ala nʼala Ijipt niile, aja ya ga-aghọ anwụ nta nke na-ata ata.”
EXO 8:17 Mosis na Erọn mere nke a. Mgbe Erọn setịpụrụ aka tie mkpanaka ya nʼelu ala, anwụ nta jupụtara nʼala Ijipt niile, nʼahụ ndị mmadụ, na nʼahụ anụmanụ ha. Ndanda ndị a jupụtakwara nʼuzuzu niile dị nʼala ahụ.
EXO 8:18 Ndị Ijipt na-eme majiki gbalịrị iji ihe nzuzo ha mee otu ihe ahụ Erọn mere, ma ha enweghị ike ime ka anwụ nta ọbụla pụta. Ebe ọ bụ na anwụ nta ndị a jupụtara nʼahụ mmadụ na nʼahụ anụmanụ niile.
EXO 8:19 Naanị ihe ndị na-eme majiki gwara Fero bụ, “Nke a bụ akaọrụ Chineke.” Ma Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ chọghị ige, ọ bụladị ndị majiki ya ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme.
EXO 8:20 Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi jekwuru Fero. Mgbe ọ ga-aga nʼosimiri, gwa ya okwu sị, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.
EXO 8:21 Ọ bụrụ na ị chọghị ime otu a, aga m eme ka igwe ijiji jupụta nʼala Ijipt niile. Ha ga-ejupụta gị nʼahụ na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi, na nʼahụ ndị gị niile, na nʼime ụlọ unu niile.
EXO 8:22 “ ‘Nʼụbọchị ahụ, igwe ijiji ndị a agaghị emetụ ndị nọ na Goshen ebe ndị m bi. Mgbe ahụ ka ị ga-amata na mụ bụ Onyenwe anyị bịara ije nʼala a.
EXO 8:23 Aga m emekwa ka ọ pụta ìhè na o nwere ihe dị iche nʼetiti ndị m na ndị gị. Ihe ịrịbama a ga-emezukwa echi.’ ”
EXO 8:24 Nʼechi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe ijiji dị egwu nʼọnụọgụgụ bịara nʼala Ijipt, jupụta nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị niile na-ejere ya ozi, na nʼala Ijipt niile. E mere ka ala Ijipt bụrụ ihe e ji ijiji mebie.
EXO 8:25 Mgbe ihe ndị a na-eme, Fero kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha okwu sị, “Gaanụ chụọrọ Chineke unu aja, ma ka ọ bụrụ nʼala Ijipt.”
EXO 8:26 Mosis zaghachiri Fero sị, “Nke ahụ abụghị ihe ziri ezi, nʼihi na aja anyị na-aga ịchụrụ Onyenwe anyị Chineke anyị bụ ihe rụrụ arụ nʼanya ndị Ijipt. Ọ bụrụ na anyị achụọ aja a nʼihu ha, ha ga-eji nkume tugbuo anyị.
EXO 8:27 Anyị ga-aga njem ụbọchị atọ nʼime ọzara gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja, dịka o nyere anyị iwu ka anyị mee.”
EXO 8:28 Fero zaghachiri ha sị, “Aga m ekwenye ka unu ga chụọrọ Onyenwe anyị Chineke unu aja nʼọzara, ma unu agaghị aga ebe dị anya. Ugbu a, kperenụ m ekpere.”
EXO 8:29 Mosis zara Fero sị ya, “Ngwangwa m si nʼihu gị pụọ, aga m arịọ Onyenwe anyị arịrịọ. Echi, a ga-esite nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị na-ejere ya ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile wezuga ijiji ndị a. Ọ ga-adị mkpa na Fero ga-elezi anya hapụ ịghọ aghụghọ ọzọ site ịjụ ka ụmụ Izrel gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.”
EXO 8:30 Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Fero pụọ rịọọ Onyenwe anyị ka o mee ka ijiji ndị a gabiga.
EXO 8:31 Onyenwe anyị mere dịka Mosis rịọrọ. Ijiji ndị a sitere nʼụlọ Fero na ụlọ ndị na-ejere ya ozi na ụlọ ndị Ijipt niile pụọ. O nwekwaghị ijiji ọ bụla fọdụrụ nʼala ahụ.
EXO 8:32 Ma nʼoge a, Fero gara nʼihu ime ka obi ya sie ike. O kweghị ka ụmụ Izrel laa.
EXO 9:1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Jekwuru Fero sị ya. ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.”
EXO 9:2 Ọ bụrụ na ị jụ, ma gaa nʼihu igbochi ha,
EXO 9:3 aka Onyenwe anyị ga-ewebata oke ọrịa na-efe efe nke ga-abịakwasị igwe anụ ụlọ unu niile dị nʼubi. Ya bụ, ịnyịnya unu, na ịnyịnya ibu unu, na ịnyịnya kamel unu, na ehi unu, na atụrụ unu na ewu unu.
EXO 9:4 Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti anụ ụlọ ndị Ijipt na nke ndị Izrel. Nʼihi ya, o nweghị anụ ụlọ ọbụla si nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel ga-anwụ.’ ”
EXO 9:5 Onyenwe anyị ekwuola oge nke a ga-amalite sị, “Echi ka Onyenwe anyị ga-eme ihe dị otu a nʼala a.”
EXO 9:6 Nʼụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe anụ ụlọ niile dị nʼIjipt nwụrụ. Ma ọ dịghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ.
EXO 9:7 Mgbe ahụ Fero zipụrụ ndị mmadụ ndị gara chọpụta na o nweghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. Ma ọ bụladị mgbe ọ chọpụtara na nke a bụ eziokwu, ọ gbanweghị obi ya, ọ nọgidere jụ ikwe ka ndị Izrel laa.
EXO 9:8 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị, “Sitenụ nʼekwu e ji esi nri kporo ntụ nke Mosis ga-awụli elu nʼihu Fero.
EXO 9:9 Ntụ ahụ ga-efesasị, dịka uzuzu nʼala Ijipt niile. Ọ ga-ebute etuto nke ga-aghọ ọnya nʼahụ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ dị iche iche dị nʼala ahụ niile.”
EXO 9:10 Mosis na Erọn kpooro ntụ gaa guzo nʼihu Fero. Mgbe Fero nọ na-ele anya Mosis wụliri ntụ ahụ elu. Ọ ghọrọ etuto, nke gbawara ghọọ ọnya nʼahụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ niile.
EXO 9:11 Ndị majiki Ijipt enweghị ike iguzo nʼihu Mosis, nʼihi etuto ndị jupụtara ha nʼahụ dịka ọ dị nʼahụ ndị Ijipt ndị ọzọ.
EXO 9:12 Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike. Ọ jụrụ ige Mosis na Erọn ntị dịka Onyenwe anyị gwara Mosis na ọ ga-eme.
EXO 9:13 Onyenwe anyị gwara Mosis ọzọ sị, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi gaa gwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.
EXO 9:14 Ma ọ bụghị ya, nʼoge a, aga m ezite ọrịa ọjọọ niile nke na-efe efe, ka ha bịakwasị gị, na ndị na-ejere gị ozi, na ndị Ijipt niile. Nke a ga-eme ka unu ghọta na ọ dịghị Onye ọzọ dịka m nʼelu ụwa niile.
EXO 9:15 Nʼihi na tupu oge a, agaara m esetipụ aka m, jiri ajọ ọrịa tie gị na ndị gị niile nke ga-egbuchapụ unu site nʼelu ụwa.
EXO 9:16 Ma ọ bụ nʼihi nke a ka m ji guzobe gị, ka m gosipụta ike m nʼebe ịnọ, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.
EXO 9:17 Ma ị nọ na-ebuli onwe gị elu megide ndị m, jụ na ha agaghị ala.
EXO 9:18 Ya mere, nʼoge dịka oge a echi, aga m ezipu oke ifufe nke ya na akụmmiri igwe so nʼala Ijipt niile. Ụdị ifufe a adịbeghị mbụ nʼala Ijipt, malite nʼoge a tọrọ ntọala ya rute ugbu a.
EXO 9:19 Ya mere, nye iwu ka a gaa ngwangwa nʼubi unu webata anụ ụlọ unu na ihe ndị ọzọ unu nwere nʼebe a ga-echebe ha, nʼihi na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-egbu mmadụ na anụ ụlọ ọbụla a hapụrụ nʼezi.’ ”
EXO 9:20 Ụfọdụ ndị na-ejere Fero ozi, ndị na-atụ okwu Onyenwe anyị egwu mere ngwangwa gaa dulata anụ ụlọ ha, na ndị ohu ha.
EXO 9:21 Ma ndị ahụ na-enweghị nrube isi nye okwu Onyenwe anyị hapụrụ ndị ohu ha nakwa anụ ụlọ ha nʼọhịa.
EXO 9:22 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis, “Setịpụ aka gị nʼeluigwe. Nke a ga-eme ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so malite izokwasị ala Ijipt niile, na ụmụ mmadụ, na anụmanụ, na ihe niile a kụrụ nʼubi nʼIjipt.”
EXO 9:23 Mgbe Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼihu eluigwe, Onyenwe anyị zidatara egbe eluigwe na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so. Amụma egbe eluigwe chakwara nʼala. Ya mere, Onyenwe anyị zidatara oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so nʼala Ijipt.
EXO 9:24 Mkpụrụ mmiri dara, amụma gbukwara nʼihu nakwa nʼazụ. Nʼezie, ọ bụ oke ifufe dị njọ, ụdị nke a na-ahụtụbeghị nʼala Ijipt kemgbe ọ ghọrọ nnukwu mba.
EXO 9:25 Mkpụrụ mmiri ahụ tigburu ihe niile dị nʼọhịa, ma mmadụ ma anụmanụ niile dị nʼala Ijipt. O feturu ihe niile na-epu nʼubi, ma ahịhịa niile dị nʼosisi.
EXO 9:26 Ma akụkụ ebe mkpụrụ mmiri ndị a na-erughị bụ naanị Goshen, ebe ụmụ Izrel bi.
EXO 9:27 Mgbe ahụ Fero ziri ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. O kwupụtara nʼihu ha sị, “Nʼoge a, emehiela m. Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, mụ na ndị m bụ ndị mejọrọ.
EXO 9:28 Kpee ekpere rịọọ Onyenwe anyị nʼihi na oke mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe a ezuola. Aga m ekwe ka unu gaa, unu agaghị atụfukwa mgbe.”
EXO 9:29 Mosis gwara Fero sị ya, “Mgbe m si nʼobodo a pụọ, aga m esetipụ aka m nʼebe Onyenwe anyị nọ, egbe eluigwe a, na ifufe a nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-akwụsịkwa. Site na nke a, ị ga-amata na ụwa niile bụ nke Onyenwe anyị.
EXO 9:30 Ma amaara m na gị onwe gị na ndị na-ejere gị ozi adịghị atụ Onyenwe anyị Chineke egwu.”
EXO 9:31 Oke ifufe ahụ nke ya na mkpụrụ mmiri so mebiri ihe a kụrụ nʼubi, dịka flakisi na ọka balị. Nʼihi na nʼoge a, ọka balị emenyela isi, flakisi etojuokwala maa ifuru.
EXO 9:32 Ma ifufe na mmiri ukwu ahụ emebighị ọka wiiti na spelti, nʼihi na ha achabeghị.
EXO 9:33 Mosis hapụrụ Fero si nʼobodo ahụ pụọ. Ọ gbasapụrụ aka ya abụọ nʼihu Onyenwe anyị, egbe eluigwe na mkpụrụ mmiri ahụ kwụsịrị. Mmiri ozuzo kwụsịkwara izo nʼala ahụ.
EXO 9:34 Mgbe Fero hụrụ na mmiri ozuzo na mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe akwụsịla, o mehiere ọzọ. Ya na ndị na-ejere ya ozi gara nʼihu nyịchie obi ha.
EXO 9:35 Ya mere, Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ jụrụ ikwere ka ụmụ Izrel pụọ, dịka Onyenwe anyị gwararịị Mosis.
EXO 10:1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Jekwuru Fero nʼihi na emeela m ka obi ya, na obi ndị na-ejere ya ozi sie ike, ka m nwee ike rụọ ọrụ ịrịbama ndị a dị iche iche nʼetiti ha.
EXO 10:2 Nke a ga-abụ akụkọ unu ga-akọrọ ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, banyere otu m si mesie ndị Ijipt ike, na otu m si rụọ ọrụ ịrịbama m nʼetiti ha, ime ka unu mata na m bụ Onyenwe anyị.”
EXO 10:3 Ọzọ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero gwa ya sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, ‘Ọ bụ ruo olee mgbe ka ị ga-ajụ iwedata onwe gị ala nʼihu m? Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.
EXO 10:4 Ọ bụrụ na ị jụ ikwere ka ha gaa, nʼụtụtụ echi, aga m ezite igurube nʼala Ijipt.
EXO 10:5 Igurube ndị a ga-ekpuchi ihu ala Ijipt niile, ka mmadụ ọbụla hapụ ịhụ ala anya. Ha ga-erichapụ ihe ndị fọdụrụ bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ahụ na-emebighị, tinyere osisi niile na-eto eto nʼubi unu.
EXO 10:6 Ha ga-ejupụta nʼụlọ gị, na nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ihe dị otu a bụ ụdị ihe na-emetụbeghị na mbụ, nke nna gị maọbụ nna nna gị ha na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe ha bidoro ibi nʼala a tutu ruo ugbu a.’ ” Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị hapụ Fero pụọ.
EXO 10:7 Ndị na-ejere Fero ozi bịakwutere ya, jụọ ya sị, “Ruo ole mgbe ka nwoke a ga-anọgide na-abụrụ anyị ihe ọnwụnwa? Hapụ ndị a ka ha laa, ka ha nwee ike ife Onyenwe anyị Chineke ha ofufe. Ọ bụ na ị ghọtabeghị na e bibiela Ijipt?”
EXO 10:8 Mgbe ahụ, a kpọghachiri Mosis na Erọn azụ nʼihu Fero. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, gaa feenụ Onyenwe anyị Chineke unu ofufe.” Fero jụkwara ha sị, “Olee ndị nʼetiti unu ga-eso unu jee?”
EXO 10:9 Mosis zaghachiri sị, “Anyị niile na-aga, ụmụntakịrị na ndị okenye, ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom, igwe ehi anyị na igwe ewu na atụrụ anyị; nʼihi na anyị na-aga ime mmemme dị nsọ nye Onyenwe anyị.”
EXO 10:10 Fero sịrị, “Ka Onyenwe anyị nọnyere unu. Ma agaghị m ekwe ka unu na ndị inyom unu, na ụmụntakịrị unu gaa. O doro anya na unu na-atụ atụmatụ ọjọọ nʼime obi unu.
EXO 10:11 Ọ gaghị adị otu a! Jeenụ naanị unu bụ ndị ikom gaa fee Onyenwe anyị unu ofufe, nʼihi na nke a bụ ihe unu na-arịọ.” Mgbe ahụ a chụpụrụ Mosis na Erọn site nʼihu Fero.
EXO 10:12 Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Setịpụ aka gị nʼala Ijipt ka igurube jupụta na ya, kpuchie ebe niile, richapụ ihe niile na-eto eto dị nʼala ahụ bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ahụ hapụrụ.”
EXO 10:13 Ya mere, Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼelu ala Ijipt, Onyenwe anyị mere ka ifufe nke si nʼebe anyanwụ si awa fee nʼụbọchị ahụ niile na abalị ahụ niile. Nʼụtụtụ ya, ifufe ahụ si nʼebe anyanwụ si awa bubatara igurube ndị ahụ.
EXO 10:14 Ha niile kpuchichara ala Ijipt niile, site nʼotu akụkụ ruo nʼakụkụ nke ọzọ. Nke a bụ mbata igurube kachasị ibe ya njọ nʼIjipt. Ijipt agaghị enwekwa nke dịka ya ọzọ.
EXO 10:15 Ha kpuchiri ala niile ruo mgbe ọchịchịrị gbachiri ya. Ha richapụrụ ihe niile na-eto nʼubi, na mkpụrụ niile na-amị nʼosisi, bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ukwu ahụ hapụrụ. Nʼikpeazụ, ọ dịghị ahịhịa ndụ fọdụrụ nʼala ma nʼelu osisi nʼIjipt niile.
EXO 10:16 Na-atụfughị oge, Fero ziri ozi ka a kpọọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Emehiela m megide unu na Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
EXO 10:17 Biko gbagharakwa m mmehie nke a, ma rịọọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka o wepụrụ m ọnwụ nke a. Ekwere m nkwa na agaghị m ajụkwa ọzọ ka unu laa.”
EXO 10:18 Mosis hapụrụ Fero pụọ gaa kpeere Onyenwe anyị ekpere.
EXO 10:19 Ngwangwa, Onyenwe anyị zitere ikuku nke si nʼebe anyanwụ na-ada bịa, nke bupụrụ igurube ndị ahụ site nʼala Ijipt, buba ha nʼOsimiri Uhie. Ọ dịkwaghị otu igurube fọdụrụ nʼala Ijipt niile.
EXO 10:20 Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike, o kweghị ka ụmụ Izrel gaa fee Chineke ofufe.
EXO 10:21 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Setịpụ aka gị abụọ nʼeluigwe ka ọchịchịrị gbaa nʼala Ijipt niile.”
EXO 10:22 Mosis setịpụrụ aka ya nʼeluigwe. Oke ọchịchịrị gbara abalị atọ nʼala Ijipt niile.
EXO 10:23 Ndị Ijipt ahụghị ihu ibe ha. Ha ahapụghịkwa ebe obibi ha abalị atọ ahụ. Ma ụmụ Izrel nwere ìhè nʼebe niile ha bi.
EXO 10:24 Mgbe ahụ, Fero kpọrọ Mosis sị ya, “Gaanụ fee Onyenwe anyị unu ofufe. Unu na ndị inyom na ụmụ unu nwere ike ịga, ma unu ga-ahapụ igwe ehi unu na igwe anụ ụlọ unu gaa.”
EXO 10:25 Mosis zara, “Ị ghaghị ịhapụ anyị ka anyị were ihe aja na aja nsure ọkụ, nke anyị chee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.
EXO 10:26 Igwe anụ ụlọ anyị ga-esoro anyị. O nweghị ihe ọ bụla anyị ga-ahapụ nʼihi na anyị ga-eji ụfọdụ nʼime ha fee Onyenwe anyị Chineke anyị ofufe. Ọ bụkwa naanị mgbe anyị ruru nʼebe ahụ ka anyị nwere ike ịmata ihe anyị ga-eji fee Onyenwe anyị anyị ofufe.”
EXO 10:27 Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike. O kweghị ka ha laa.
EXO 10:28 Fero gwara Mosis sị, “Si nʼihu m pụọ. Lezie anya hụ na ị bịaghị nʼihu m ọzọ. Ụbọchị ọbụla ị nwara bịa nʼihu m, onye nwụrụ anwụ ka ị ga-abụ.”
EXO 10:29 Mosis zaghachiri Fero sị, “Ihe i kwuru dị mma, agaghị m abịakwa nʼihu gị ọzọ.”
EXO 11:1 Onyenwe anyị gwara Mosis, “Aga m ewetara Fero na Ijipt otu ihe otiti ọzọ. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ekwe ka unu si nʼebe a pụọ. Nʼeziokwu, ọ ga-eji aka ya chụpụ unu nʼala ya.
EXO 11:2 Gwa nwoke na nwanyị Izrel ọbụla ka ha jikere. Ha rịọọ ndị agbataobi ha bụ ndị Ijipt, ka ha nye ha ihe ọbụla e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ.”
EXO 11:3 Onyenwe anyị mere ka ụmụ Izrel nweta ihuọma nʼebe ndị Ijipt, na ndị agbataobi ha nọ. Nke ka nke, Mosis ghọrọ onye a na-asọpụrụ nʼetiti ndị ozi Fero na nʼihu ndị Ijipt niile.
EXO 11:4 Ya mere, Mosis sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Nʼihe dịka nʼetiti abalị taa, aga m agafe nʼime ala Ijipt niile.
EXO 11:5 Mgbe nke a na-eme, ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt ga-anwụ, site nʼọkpara Fero, onye nọ ugbu a nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara ohu onye nwanyị na-akwọ ihe na nkume ịkwọ nri, na ụmụ ehi niile e bụ ụzọ mụọ.
EXO 11:6 Mgbe nke a mere, iti mkpu akwa dị ukwuu ga-adị nʼala Ijipt, ụdị ga-ada nʼala Ijipt niile nke na-adịbeghị nʼala Ijipt, ụdị iti mkpu akwa nke na-agaghị adịkwa ọzọ.
EXO 11:7 Ma nʼebe ụmụ Izrel nọ, nkịta agaghị agbọ nwoke maọbụ nwanyị maọbụ anụmanụ ọbụla ụja.’ Site na nke a, ị ga-amata na Onyenwe anyị na-akpa oke nʼetiti ndị Izrel na ndị Ijipt.
EXO 11:8 Ndị ọchịchị gị ndị a ga-abịa gbuo ikpere rịọọ m sị m, ‘Biko kpọrọ ndị gị pụọ nʼobodo anyị.’ Mgbe ha mesịrị nke a, aga m apụ.” Iwe were Mosis mgbe o si nʼụlọ Fero na-apụta.
EXO 11:9 Onyenwe anyị agwalarị Mosis sị ya, “Fero agaghị ege gị ntị. Nke a ga-enye m ohere ime ọtụtụ ihe ebube dị iche iche nʼIjipt.”
EXO 11:10 Ọ bụ ezie na Mosis na Erọn mere ihe ebube ndị a nʼihu Fero, ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike, ka ọ hapụ ikwe ka ụmụ Izrel si nʼala ya pụọ.
EXO 12:1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu nʼala Ijipt sị ha,
EXO 12:2 “Ọnwa a ga-abụrụ unu isi ọnwa. Ọ ga-abụ ọnwa mbụ nke ọnwa niile nʼafọ unu.
EXO 12:3 Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha, Nʼafọ ọbụla, nʼabalị iri nke ọnwa a, nwoke ọbụla ga-eweta nwa atụrụ nʼisi ezinaụlọ ọbụla.
EXO 12:4 Ezinaụlọ ọbụla nke dịkarịrị nta, nke na-enweghị ike iweta na iricha otu nwa atụrụ, ga-ejekwuru ezinaụlọ ọzọ dịkwa nta, ka ha jikọtaa onwe ha ọnụ weta nwa atụrụ. Ndị ga-ejikọta onwe ha ọnụ aghaghị ibu ụzọ pịa mmadụ ole ha ga-adị nwee ike richaa otu atụrụ.
EXO 12:5 Nwa atụrụ a ga-eweta ga-abụ oke gbara naanị otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla nʼahụ ya. Unu nwere ike họrọ atụrụ maọbụ ewu.
EXO 12:6 Unu ga-elekọta ya anya ruo nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa a. Nʼabalị ụbọchị ahụ ka ọgbakọ Izrel niile ga-egbu ya.
EXO 12:7 Ha ga-ewere ọbara ya tee nʼelu na nʼakụkụ ibo ọnụ ụzọ nke dị nʼezinaụlọ ha niile, ebe ha ga-anọ rie anụ atụrụ ahụ.
EXO 12:8 Ha ga-eri anụ atụrụ a, nke a ga-ahụ nʼọkụ nʼabalị ahụ, ya na achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ndụ na-elu ilu.
EXO 12:9 A gaghị eri nwa atụrụ ọbụla na ndụ, a gaghị esikwa ya esi, kama a ga-ahụ ya nʼọkụ. A ga-ahụ akụkụ ahụ nwa atụrụ ọbụla nʼọkụ, tinyere isi ya, ụkwụ ya na ihe dị nʼime afọ ya.
EXO 12:10 Unu agaghị erifọdụ ya ruo nʼụtụtụ echi ya. Nke ọbụla ga-afọdụ nʼabalị ahụ, a ga-akpọ ya ọkụ.
EXO 12:11 Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.
EXO 12:12 “Aga m agafe nʼala Ijipt nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile Ijipt na-efe ofufe. Abụ m Onyenwe anyị.
EXO 12:13 Ọbara ahụ unu ga-ete nʼọnụ ibo ụlọ unu ga-abụ ihe ama igosi ebe unu bi, nʼihi na mgbe m hụrụ ọbara ahụ, aga m agafe unu. Ọ nwekwaghị ihe otiti ga-abịakwasị unu mgbe m ga-egbu ndị Ijipt.
EXO 12:14 “Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye Onyenwe anyị. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
EXO 12:15 Ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko. Nʼụbọchị mbụ nke ụbọchị asaa ahụ, ka unu ga-esite nʼụlọ unu wezuga ihe iko achịcha niile, nʼihi na onye ọbụla riri nri nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị nke asaa, aghaghị ibipụ ya site nʼala Izrel.
EXO 12:16 Unu ga-ewere ụbọchị mbụ na ụbọchị nke asaa, nke mmemme ahụ, nwee mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị abụọ ndị a, karịakwa isi nri unu ga-eri.
EXO 12:17 “Unu ga-edobekwa mmemme achịcha na-ekoghị eko nʼihi na ọ bụ nʼime otu ụbọchị a ka m sitere nʼala Ijipt kpọpụta unu dịka usuu ndị agha. Unu ga-emekwa mmemme ụbọchị a ka ọ bụrụ ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ
EXO 12:18 Nʼọnwa mbụ, nʼanyasị nke ụbọchị nke iri na anọ, ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ruo nʼanyasị nke ụbọchị iri abụọ na otu.
EXO 12:19 Nʼime ụbọchị asaa ahụ, agaghị ahụ ihe na-eko achịcha nʼụlọ unu. A ga-esite nʼọgbakọ ndị Izrel bipụ onye ọbụla riri ihe ọbụla nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya. Iwu a dịrị ndị ọbịa niile nʼala Izrel, dịkwara ndị nwa afọ ala.
EXO 12:20 Unu agaghị eri ihe ọbụla e ji ihe na-eko achịcha mee. Nʼebe obibi unu niile, ọ bụ naanị achịcha na-ekoghị eko ka unu ga-eri.”
EXO 12:21 Mgbe ahụ, Mosis kpọkọtara ndị okenye ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, “Gaanụ họpụta ụmụ atụrụ nʼihi agbụrụ unu niile, gbuonụ atụrụ ngabiga ndị a.
EXO 12:22 Were ahịhịa hisọp, denye ya nʼọbara si nʼatụrụ ndị a nke a ga-awụnye nʼefere, tee ya nʼelu ibo na nʼakụkụ abụọ nke ọnụ ụzọ ụlọ unu. Onye ọbụla nʼime unu agaghị apụ nʼezi tutu ruo ụtụtụ.
EXO 12:23 Mgbe Onyenwe anyị ga-agafe igbu ndị Ijipt, ọ ga-ahụ ọbara ahụ nʼawara na mbudo ibo ọnụ ụzọ ụlọ unu. Ọ ga-agafe ụlọ unu, gharakwa ikwe ka onye mbibi bata nʼụlọ unu gbuo unu.
EXO 12:24 “Unu ga-edobe mmemme a dịka iwu ga-adịgide nye unu na ụmụ unu.
EXO 12:25 Mgbe unu batara nʼala ahụ Onyenwe anyị ga-enye unu dịka o kwere na nkwa, unu ga-edobe ofufe a.
EXO 12:26 Mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị ka ofufe a pụtara?’
EXO 12:27 Unu ga-azaghachi ha sị, ‘Ọ bụ aja ngabiga anyị na-achụrụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ gafere ụlọ ụmụ Izrel nʼala Ijipt, mgbe o gburu ndị Ijipt, ma o nweghị onye ọbụla nʼime anyị o gburu.’ ”
EXO 12:28 Ụmụ Izrel mezuru ihe niile Onyenwe anyị gwara ha site nʼọnụ Mosis na Erọn.
EXO 12:29 Nʼime etiti abalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gburu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, malite nʼọkpara Fero onye nọ nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara nke onye Ijipt nọ nʼụlọ mkpọrọ olulu. O gbukwara ụmụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ.
EXO 12:30 Nʼabalị ahụ kwa, Fero na ndị ozi ya, na ndị Ijipt niile biliri. Oke iti mkpu akwa dakwara nʼala Ijipt, nʼihi na ọ dịghị ezinaụlọ ọnwụ na-erughị.
EXO 12:31 Nʼotu abalị ahụ, Fero zipụrụ ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Ngwa bilienụ, unu bụ ụmụ Izrel niile. Kewapụnụ onwe unu site nʼetiti anyị. Gaanụ, fee Onyenwe anyị unu ofufe dịka unu rịọrọ.
EXO 12:32 Durunụ igwe ehi na atụrụ unu mgbe unu na-aga. Gọziekwanụ m mgbe unu na-apụ.”
EXO 12:33 Ndị Ijipt gbalịrị ime ka ụmụ Izrel hapụ ha ngwangwa. Ha sịrịtara onwe ha, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ahapụghị anyị ugbu a, anyị niile ga-anwụkwa.”
EXO 12:34 Ya mere, ụmụ Izrel buuru ụtụ ọka e ji eme achịcha na-ekoghị eko, nke ha tinyere nʼefere e ji agwakọta ya. Ha ji akwa kechie ha, bukwasị ha nʼubu ha.
EXO 12:35 Ha mekwara ihe ndị ọzọ dịka Mosis gwara ha. Ha rịọrọ ndị Ijipt ka ha nye ha ihe iji ngwa nke ọlaọcha na ọlaedo, na uwe.
EXO 12:36 Onyenwe anyị nyere ndị ya amara nʼihu ndị Ijipt, ha nyere ha ihe niile ha rịọrọ. Site nʼụzọ dị otu a, ụmụ Izrel napụtara ndị Ijipt ihe niile ha ji biri nʼụlọ.
EXO 12:37 Mgbe nke a gasịrị, ụmụ Izrel malitere ije ha site na Ramesis. Mgbe ha hapụrụ Ramesis, na-eje Sukọt, ha dị narị puku ndị ikom isii, na-agụghị ndị inyom na ụmụntakịrị.
EXO 12:38 Ọtụtụ mmadụ dị iche iche sooro ha nʼije ha. Ha dukwa igwe anụ ụlọ, igwe ewu na atụrụ ha, nke dị ukwu nʼọnụọgụgụ.
EXO 12:39 Ha ji ụtụ ọka ha si Ijipt buputa mee achịcha na-ekoghị eko. Nʼihi na a chụpụrụ ha achụpụ site nʼIjipt, ha enweghị ezi ohere kwadooro onwe ha ihe oriri.
EXO 12:40 Tupu ha ahapụ ala Ijipt, ụmụ Izrel ebiela nʼebe ahụ narị afọ anọ na iri afọ atọ.
EXO 12:41 Mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ zuru, nʼụbọchị ahụ o zuru, usuu ndị Onyenwe anyị niile hapụrụ Ijipt.
EXO 12:42 Onyenwe anyị chere nche nʼabalị ụbọchị ahụ maka ịkpọpụta ha site nʼala Ijipt. Nʼihi ya, abalị ụbọchị ahụ bụ mgbe pụrụ iche nye ụmụ Izrel maka iji iche nche sọpụrụ Onyenwe anyị nʼọgbọ ha niile.
EXO 12:43 Onyenwe anyị kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha sị, “Ndị a bụ usoro iwu metụtara Mmemme Ngabiga: “Onye mba ọzọ agaghị eri anụ nwa atụrụ ahụ.
EXO 12:44 Ohu ọbụla a kwụrụ ụgwọ nʼisi ya ga-eri ya naanị ma e biri ya ugwu.
EXO 12:45 Ohu e goro ọrụ, maọbụ onye ọbịa ọbụla agaghị eri ya.
EXO 12:46 “A ga-eri ya naanị nʼime otu ụlọ. Ọ gaghị apụ nʼezi. Unu agaghị atapịa ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ.
EXO 12:47 Nzukọ niile nke ụmụ Izrel ga-eme Mmemme Ngabiga a.
EXO 12:48 “Onye mba ọzọ bi nʼetiti unu chọrọ isoro unu na Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị aghaghị ibi ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya ugwu. Mgbe ahụ, ọ ga-abịaru nso isoro na mmemme, nʼihi na a ga-agụ ya dịka nwa afọ ala. Ọ dịghị onye ikom a na-ebighị ugwu ga-eri nri ahụ.
EXO 12:49 Otu iwu a dịrị nwa afọ ala na ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel.”
EXO 12:50 Ụmụ Izrel mere ihe ndị a niile, dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu site nʼọnụ Mosis na Erọn.
EXO 12:51 Ọ bụkwa nʼotu ụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị sitere nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel, dịka usuu ha niile si dị.
EXO 13:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
EXO 13:2 “Dooro m nsọ onye ọbụla bụ ọkpara, onye ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼetiti ụmụ Izrel, na nʼetiti mmadụ ma nʼetiti anụ ụlọ, nke m ka ọ bụ.”
EXO 13:3 Mosis gwara ndị Izrel sị, “Chetanụ ụbọchị taa, ụbọchị unu si nʼala Ijipt pụta, ala ebe unu bụ ndị ohu, nʼihi na Onyenwe anyị sitere nʼike aka ya dị ukwu kpọpụta unu site nʼebe ahụ. Unu erikwala achịcha ọbụla e ji ihe na-eko achịcha mee.
EXO 13:4 Taa, nʼọnwa Abib, bụ ụbọchị unu na-ahapụ ala Ijipt.
EXO 13:5 Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọrait, ndị Hiv na ndị Jebus bi nʼime ya, bụ ala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha na ọ ga-enye unu, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, unu ga-eme ofufe mmemme a nʼọnwa a.
EXO 13:6 Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa ahụ. Nʼụbọchị nke ikpeazụ nʼime ụbọchị asaa ahụ, unu ga-eme mmemme oke oriri nʼihu Onyenwe anyị.
EXO 13:7 Rienụ achịcha na-ekoghị eko nʼime ụbọchị asaa ndị ahụ. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼụlọ unu. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼoke ala unu niile.
EXO 13:8 Nʼoge ọbụla ị na-eme mmemme a, kọwaara nwa gị nwoke ihe kpatara i ji eme mmemme a, si ya, ‘Ana m eme mmemme a maka icheta ihe Onyenwe anyị meere m, mgbe m si nʼIjipt pụta.’
EXO 13:9 Imezu mmemme a ga-adịrị unu dịka ihe ịrịbama nʼala unu, dịrịkwa ka ihe ngosi nʼegedege ihu unu, ichetara unu na Onyenwe anyị ji aka ike ya dupụta anyị site nʼala Ijipt.
EXO 13:10 Unu ga na-eme mmemme a nʼoge a kara aka nʼafọ ọbụla.
EXO 13:11 “Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, nyefee unu ala ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha,
EXO 13:12 unu ga-enyefe Onyenwe anyị ụmụ ndị ikom unu niile e bụ ụzọ mụọ. Ọzọ, ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ bụ nke Onyenwe anyị.
EXO 13:13 Jiri nwa atụrụ gbapụta nwa ịnyịnya ibu mbụ e bụ ụzọ mụọ. Ọ bụrụ na unu achọghị ịgbara nwa ịnyịnya ibu ahụ, unu aghaghị ịgbaji ya olu. Ma unu aghaghị ịgbara ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ.
EXO 13:14 “Nʼoge dị nʼihu, mgbe nwa gị nwoke ga-ajụ gị sị, ‘Gịnị ka ihe ndị a pụtara?’ Ị ga-azaghachi ya sị, ‘Onyenwe anyị jiri aka ike dị ukwu dupụta anyị site nʼIjipt, site nʼala nke ohu.
EXO 13:15 Mgbe Fero mesiri obi ya ike, jụ ka anyị si nʼala ya pụọ, Onyenwe anyị gburu ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ ma anụ ụlọ. Nʼihi ya, ana m eji ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ achụ aja nye Onyenwe anyị. Ma ụmụ m ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ ka m na-agbapụta.’
EXO 13:16 Mmemme a ga-adị ka ihe ịrịbama nʼanya unu, dịrịkwa ka ihe ngosi nʼegedege ihu unu, ichetara unu na Onyenwe anyị ji aka ike ya dupụta anyị site nʼala Ijipt.”
EXO 13:17 Mgbe Fero mesịrị kwere ka ụmụ Izrel laa, Chineke edughị ha site nʼụzọ ahụ gafere ala ndị Filistia. Ọ bụ ezie na ụzọ ahụ dị nso karịa. Chineke mere nke a nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na ndị a ezute agha, ha nwere ike ịgbanwe obi ha tụgharịa ịlaghachi azụ nʼIjipt.”
EXO 13:18 Ya mere, Chineke duuru ha ga nʼụzọ Osimiri Uhie, nke gara nʼụzọ nke ọzara. Ụmụ Izrel kwadokwara akwado ibu agha mgbe ha si nʼala Ijipt pụọ.
EXO 13:19 Mosis buuru ọkpụkpụ Josef mgbe ha na-ala. Nʼihi na o mere ka ụmụ Izrel ṅụọ iyi na ha ga-eme otu a, na-asị, “Chineke ga-eleta unu nʼezie, mgbe ahụ, unu aghaghị iburu ọkpụkpụ m si nʼebe a pụọ.”
EXO 13:20 Ha si Sukọt bilie ije, maa ụlọ ikwu ha na Etam, na nsọtụ ọzara.
EXO 13:21 Onyenwe anyị ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị.
EXO 13:22 Ma ogidi igwe ojii nʼehihie na ogidi ọkụ ahụ nʼabalị, ọ dịghị nke hapụrụ ọnọdụ ya nʼihu ha.
EXO 14:1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis,
EXO 14:2 “Gwa ụmụ Izrel ka ha chigharịa azụ jee maa ụlọ ikwu ha na ncherita ihu Pi Hahirot, nke dị nʼetiti Migdol na osimiri. Ọ bụ nʼakụkụ osimiri, na ncherita ihu obodo Baal-Zefọn ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha.
EXO 14:3 Fero ga-asị banyere ụmụ Izrel, ‘Ha na-awagharị gburugburu ala ahụ nʼọnọdụ mgbagwoju anya ebe ọzara riri ha.’
EXO 14:4 Aga m eme ka obi Fero sie ike ka ọ chụso unu ọsọ nʼazụ, ma m ga-ewetara onwe m otuto site na Fero na ndị agha ya niile. Ndị Ijipt niile ga-ama na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” Ndị Izrel mekwara otu ahụ.
EXO 14:5 Mgbe a gwara eze Ijipt na ndị a agbaala ọsọ, obi Fero na ndị ozi ya gbanwere megide ndị Izrel. Ha sịrị, “Gịnị bụ ihe anyị mere, site na izipụ ndị Izrel nʼọrụ ife anyị?”
EXO 14:6 Na-atụfughị oge, Fero rigoro nʼelu ụgbọ agha ya, duru ndị agha ya ịchụso ha.
EXO 14:7 Ọ chịịrị ụgbọ agha dị narị isii e leziri anya họpụta, tinyere ụgbọ agha Ijipt niile. Ndịisi agha ndị Ijipt nọcha nʼelu ha niile.
EXO 14:8 Onyenwe anyị mere ka obi Fero eze Ijipt sie ike. Ọ chụsoro ụmụ Izrel, ndị na-aga nʼihu nʼije ha, na-atụghị egwu maọbụ ịda mba.
EXO 14:9 Ndị Ijipt chụsoro ha ọsọ, ịnyịnya Fero na ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ndị ọzọ chụsoro ndị Izrel ọsọ chụkwute ha nʼebe ha na-ezu ike nʼakụkụ osimiri dị nso na Pi Hahirot na ncherita ihu Baal-Zefọn.
EXO 14:10 Mgbe ndị agha Fero na-abịa nso, ndị Izrel lere anya nʼazụ, hụ ndị Ijipt ka ha na-abịa nso. Ha tụrụ egwu, tie mkpu akwa, kpọkuo Onyenwe anyị.
EXO 14:11 Ha jụrụ Mosis sị, “Ọ bụ na o nweghị ili dị nʼala Ijipt, i ji kwagide anyị ka anyị niile bịa nwụọ nʼebe a nʼọzara? Gịnị mere i ji kwagide anyị ka anyị hapụ Ijipt?
EXO 14:12 Ọ bụ na anyị agwaghị gị nʼala Ijipt si gị, ‘Hapụ anyị ka anyị nọgide na-ejere ndị Ijipt ozi?’ Ọ gara akara anyị mma ị bụ ohu ndị Ijipt karịa ịnwụ nʼọzara.”
EXO 14:13 Mosis zaghachiri ha sị, “Unu atụla egwu. Guzosienụ ike. Unu ga-ahụ ụzọ dị ebube Onyenwe anyị ga-esi zọpụta unu taa. Ndị Ijipt a unu na-ahụ taa, unu agaghị ahụkwa ha ọzọ.
EXO 14:14 Nọrọnụ jii. Onyenwe anyị ga-alụrụ unu ọgụ.”
EXO 14:15 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Gịnị mere i ji na-akpọku m. Gwa ụmụ Izrel ka ha gaa nʼihu.
EXO 14:16 Welie mkpanaka gị elu. Setịpụ ya nʼelu osimiri ahụ ka o kewaa abụọ. Ụzọ ga-adịkwa nʼetiti osimiri ahụ. Ụmụ Izrel ga-esitekwa nʼala akọrọ gafee.
EXO 14:17 Aga m eme ka obi ndị Ijipt sie ike, ka ha sorokwa unu nʼazụ banye. Aga m ewetara onwe m otuto site na Fero, na ndị agha niile, na ụgbọ agha niile nakwa ndị na-agba ịnyịnya ya.
EXO 14:18 Nʼoge ahụ, ndị Ijipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. M ga-enweta nsọpụrụ site na Fero, na ụgbọ agha ya niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.”
EXO 14:19 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke, onye na-aga nʼihu ndị agha Izrel, sitere nʼihu pụọ gaa nọdụ nʼazụ ha. Otu a kwa, ogidi igwe ojii ahụ sitere nʼihu gaa nʼazụ ha.
EXO 14:20 Nke a mere ka ogidi igwe ojii ahụ dịrị nʼetiti ụmụ Izrel na ndị Ijipt. Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ogidi igwe ojii ahụ nye ụmụ Izrel ìhè, ma ndị Ijipt nọgidere nʼọchịchịrị. Otu a, ndị Ijipt enweghị ike bịarute nʼebe ụmụ Izrel nọ.
EXO 14:21 Mgbe ahụ, Mosis setịpụrụ aka ya nʼelu Osimiri Uhie ahụ. Onyenwe anyị ji oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke fere nʼabalị ahụ niile, nughachi osimiri ahụ, mee ka osimiri ahụ kebie ụzọ abụọ, ka ụzọ pụta nʼala osimiri ahụ.
EXO 14:22 Ụmụ Izrel sitere nʼetiti osimiri ahụ gafee. Mmiri osimiri ahụ ghọọrọ mgbidi nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha.
EXO 14:23 Mgbe ndị agha Ijipt na-achụ ha ọsọ hụrụ ha ka ha na-agafe, ha sogidere ha baa, ọ bụladị nʼetiti osimiri ahụ. Ndị agha Ijipt niile sooro ha, ya bụ, ụgbọ agha Fero, ndị agha ya na ndị na-agba ịnyịnya ya niile.
EXO 14:24 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị ledatara anya site nʼogidi igwe ojii ahụ na-enye ihe. O legidere ndị agha Ijipt anya, tinyekwa ha ụjọ nʼobi nke mere na ha amakwaghị onwe ha.
EXO 14:25 O mebiri ụkwụ ụgbọ agha ha mee ka o siere ịnyịnya ha ike ịdọkpụ ụgbọ agha ndị ahụ. Mgbe ahụ, ndị Ijipt kwuru sị, “Ka anyị sinụ nʼịchụ ndị Izrel gbapụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-alụrụ ha ọgụ, na-emegidekwa anyị.”
EXO 14:26 Mgbe ụmụ Izrel gafesịrị ruo nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Setịpụ aka gị ọzọ ka mmiri ahụ kpuchigide ndị Ijipt, na ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.”
EXO 14:27 Mosis setịpụrụ aka nʼelu osimiri ahụ. Nʼụtụtụ ya, mmiri osimiri ahụ sọghachiri gaa ebe ọ nọ na mbụ. Ndị Ijipt chọsịrị ụzọ ha si agbapụ ike, ma Onyenwe anyị mere ka osimiri ahụ kpuchie ha.
EXO 14:28 Osimiri ahụ kpuchigidere ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya, na ndị agha Fero niile ndị chụụrụ ụmụ Izrel baa nʼime osimiri ahụ. O nweghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.
EXO 14:29 Ma ụmụ Izrel esitelarị nʼala nke mmiri kọrọ gafee osimiri ahụ. Mgbe ha na-agafekwa, akụkụ abụọ nke osimiri ahụ guzoro ọtọ dịka mgbidi, nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha.
EXO 14:30 Site nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị zọpụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị Ijipt. Ụmụ Izrel hụkwara ozu ndị Ijipt nʼikpere mmiri osimiri ahụ.
EXO 14:31 Ụmụ Izrel tụrụ egwu Onyenwe anyị mgbe ha hụrụ ihe ịrịbama ndị a Onyenwe anyị ji zọpụta ha site nʼaka ndị Ijipt. Ha kwenyere na Onyenwe anyị, kwenyekwa na Mosis ohu ya.
EXO 15:1 Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru Onyenwe anyị abụ dị otu a sị, “Aga m abụku Onyenwe anyị abụ nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu. Ọ tụnyela ịnyịnya na onye na-agba ya nʼosimiri.
EXO 15:2 “Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m. Ọ ghọrọla m nzọpụta. Ọ bụ Chineke m, aga m etokwa ya, Chineke nke nna m, aga m ebulikwa ya elu.
EXO 15:3 Onye na-ebu agha ka Onyenwe anyị bụ. Nʼezie, aha ya bụ Onyenwe anyị.
EXO 15:4 Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya, ka ọ tụnyere nʼosimiri ahụ. Ndịisi agha Fero, ndị ahọrọ ahọ, ka o mere ka Osimiri Uhie rie.
EXO 15:5 Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha. Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume.
EXO 15:6 Aka nri gị Onyenwe anyị, dị ike, dịkwa ebube. Aka nri gị, Onyenwe anyị na-etipịasị ndị iro.
EXO 15:7 “Nʼoke ike nke ịdị elu gị, Ị lụgbuola ndị niile na-ebili imegide gị. I zipụrụ iwe gị dị ọkụ, o repịara ha dịka igbugbo ọka.
EXO 15:8 I sitere na nkuume nke oghere imi gị, mee ka mmiri osimiri guzoro ọtọ. Mmiri ahụ na-erugharị erugharị guzoro nʼotu ebe dịka mgbidi; ogbu mmiri kpụkọtara rahụ nʼala ala nsọtụ nke osimiri.
EXO 15:9 Onye iro nyara isi sị, ‘Aga m achụso ha, gafee ha. Aga m ekesa ihe a kwatara nʼagha. Nyejuo onwe m afọ site na ha. Aga m amịpụta mma agha m. Jiri aka m laa ha nʼiyi.’
EXO 15:10 Ma i kupụrụ ikuku si gị nʼimi pụta, osimiri riri ha, ha mikpuru nʼime osimiri ukwu ahụ dịka igwe.
EXO 15:11 Onye dịka gị Onyenwe anyị, nʼetiti chi niile? Onye dịka gị? Onye dị ebube nʼịdị nsọ. Onye otuto ya na-eyi egwu. Onye na-arụ ọrụ dị ebube?
EXO 15:12 “I setịpụrụ aka nri gị, ala meghere ọnụ ya loo ndị iro gị niile.
EXO 15:13 Site nʼebere gị, i dupụtara ndị ị zọpụtara. Sitekwa nʼike gị dị ebube, i duru ha ruo nʼebe obibi gị dị nsọ.
EXO 15:14 Ụwa niile nụrụ ya, maa jijiji. Ndị Filistia ka oke ihe mgbu bịakwasịrị.
EXO 15:15 Ndị eze Edọm ga-anọ nʼọnọdụ obi ịlọ mmiri. Ndị ndu Moab niile ga-abụ ndị ọma jijiji ga-ejidekwa, ndị Kenan niile nʼọnọdụ ịtụ egwu ga-agbaze;
EXO 15:16 oke egwu na oke ụjọ ejidela ha. Site nʼike nke aka gị, ha ga-anọ jụụ dịka nkume, tutu ruo mgbe ndị gị, Onyenwe anyị, gafechara, tutu ruo mgbe ndị gị, ndị ị zụtara nye onwe gị, gafechara.
EXO 15:17 Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ, nʼelu ugwu nke ihe nketa gị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị, ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya.
EXO 15:18 “Onyenwe anyị ga-abụ eze ruo mgbe niile ebighị ebi.”
EXO 15:19 Mgbe ịnyịnya Fero, na ụgbọ agha ya, na ndị na-agba ịnyịnya, gbabanyere nʼosimiri, Onyenwe anyị mere ka mgbidi mmiri ahụ dagbuo ha. Ma ụmụ Izrel sitere nʼala mmiri kọrọ gafee.
EXO 15:20 Nʼoge ahụ, Miriam onye amụma nwanyị, nwanne Erọn weere ịgba iti egwu nʼaka ya, duo ndị inyom ndị so ya, jiri ịgba egwu nke ha na-etekwa egwu.
EXO 15:21 Miriam bụrụ abụ sị ha, “Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nke ukwu. Ịnyịnya na ndị na-agba ha, ka ọ tụnyere nʼime osimiri.”
EXO 15:22 Mgbe ihe ndị a mesịrị, Mosis nọgidere na-edu ụmụ Izrel. Ha sitere nʼOsimiri Uhie ahụ bilie ije, jeruo ọzara Shua. Ha jere ije nʼime ọzara abalị atọ, ma ha achọtaghị mmiri ọṅụṅụ
EXO 15:23 Mgbe ha ruru Mara, ha enweghị ike ịṅụ mmiri dị nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri ahụ na-elu ilu. (Ọ bụ ilu ilu a mere e ji kpọọ ya Mara.)
EXO 15:24 Nʼebe a, ụmụ Izrel malitere itamu ntamu, megide Mosis sị, “Olee mmiri anyị ga-aṅụ?”
EXO 15:25 Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa. Onyenwe anyị gosiri Mosis osisi ọ ga-atụnye nʼime mmiri ahụ. Mgbe Mosis mere otu a, mmiri ahụ malitere ịdị ụtọ ọṅụṅụ. Ọ bụkwa na Mara ka Onyenwe anyị nọ nye ha ụkpụrụ ya na iwu ya maka iji ya nwalee ha.
EXO 15:26 Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu ga-ege ntị nke ọma nʼokwu Onyenwe anyị Chineke unu, mee ihe ziri ezi nʼanya ya, ọ bụrụkwa na unu eleruo anya idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, ọ dịghị ọrịa nke m tinyere nʼahụ ndị Ijipt nke m ga-etinye nʼahụ unu. Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-agwọ unu ọrịa niile.”
EXO 15:27 Ha bịaruru nʼobodo Elim, ebe e nwere isi iyi mmiri ala na-asọpụta dị iri na abụọ, na iri osisi nkwụ asaa. Ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri ahụ.
EXO 16:1 Ọgbakọ ụmụ Izrel niile hapụrụ obodo Elim, jere ije bịarute nʼọzara Sin nke dị nʼetiti Saịnaị na Elim. Ha bịaruru nʼebe ahụ nʼabalị iri na ise nke ọnwa abụọ, site na mgbe ha hapụrụ Ijipt.
EXO 16:2 Nʼọzara ahụ, nzukọ ahụ niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn.
EXO 16:3 Ụmụ Izrel gwara ha sị, “Ọ gaara adị anyị mma ma a sị na Onyenwe anyị gburu anyị nʼala Ijipt. Nʼebe ahụ ite anụ dị iche iche na-adọ nʼihu anyị, anyị na-erikwa ụdị nri ọbụla anyị chọrọ. Ugbu a, i dubatala anyị nʼọzara ka anyị niile nwụọ nʼagụụ.”
EXO 16:4 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu.
EXO 16:5 Gwa ha na nʼụbọchị nke isii, ha ga-ewere nri ha ga-ericha nʼụbọchị ahụ, ma nri ha ga-eri nʼụbọchị nke asaa, ka ha ga-achịkọta nʼụbọchị nke isii.”
EXO 16:6 Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel sị ha, “Nʼanyasị a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị dupụtara unu site nʼala Ijipt.
EXO 16:7 Unu ga-ahụkwa ebube Onyenwe anyị nʼụtụtụ echi, nʼihi na Onyenwe anyị anụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ unu ga-eji na-atamu ntamu megide anyị?”
EXO 16:8 Mosis kwukwara sị, “Mgbe Onyenwe anyị nyere unu anụ unu ga-eri nʼanyasị a, nyekwa unu achịcha ga-eju unu nʼụtụtụ, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, nʼihi ọ nụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ? Ọ bụghị anyị ka unu na-atamu megide kama ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-atamu megide.”
EXO 16:9 Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn okwu sị ya, “Gwa nzukọ Izrel niile okwu sị ha, ‘Pụtanụ bịa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nụla ntamu unu.’ ”
EXO 16:10 Mgbe Erọn nọ na-agwa nzukọ Izrel okwu, ha lepụrụ anya nʼọzara hụ ebube Onyenwe anyị ka ọ pụtara ihe nʼigwe ojii.
EXO 16:11 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
EXO 16:12 “Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”
EXO 16:13 Nʼoge uhuruchi ụbọchị ahụ, nnụnụ kweel bịara kpuchie ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, igirigi dakwara gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
EXO 16:14 Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile.
EXO 16:15 Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a?” Mosis zaghachiri ha sị, “Ọ bụ achịcha Onyenwe anyị nyere unu ka unu rie.
EXO 16:16 Ihe ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere, ‘Ka onye ọbụla chịkọta naanị nke ọ ga-ericha. Ihe ọtụtụ ọmaa maka otu onye dịka ọnụọgụgụ ha si dị nʼezinaụlọ.’ ”
EXO 16:17 Ụmụ Izrel mere dịka a gwara ha, ụfọdụ chịkọtara nke hiri nne, ụfọdụ nke dị nta.
EXO 16:18 Mgbe ha ji ihe ọtụtụ ọmaa tụọ ya, ha chọpụtara na onye chịkọtara hie nne enweghị karịa nke zuru ya, onye chịkọtakwara nke nta, ọ dịghị ihe fọdụrụ ya inweta. Onye ọbụla chịkọtara dị ka ihe ga-ezuru ya si dị.
EXO 16:19 Mosis gwara ha sị, “Ka onye ọbụla hụ na o nweghị nke ga-afọdụ ruo ụtụtụ echi ya.”
EXO 16:20 Ma ụfọdụ nʼime ha egeghị Mosis ntị. Ha rifọrọ nri ahụ debe ya. Ma mgbe chi echi ya bọrọ, ha chọpụtara na ha ereela ure jupụta nʼikpuru, ma na-esikwa isi dị njọ. Mosis were iwe dị ukwuu megide ụmụ Izrel nʼihi ya.
EXO 16:21 Site nʼụbọchị ahụ, gaa nʼihu, ezinaụlọ ọbụla na-ewebata nri nʼụtụtụ ọbụla, dịka mkpa ha siri dị. Mgbe anwụ wara, nri ahụ niile fọdụrụ na-agbaze.
EXO 16:22 Nʼụbọchị nke isii, ha na-ewere nri okpukpu abụọ karịa ka ha na-ewe nʼụbọchị ndị ọzọ. Mgbe ndịisi nzukọ Izrel hụrụ mgbanwe dị otu a, ha bịara kọọrọ Mosis.
EXO 16:23 Mosis zara sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere: ‘Ụbọchị echi bụ ụbọchị izuike, ụbọchị nke asaa dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ya mere, sienụ ihe niile unu nwere isi taa, nʼihi na unu agaghị esi ihe ọbụla echi. Nri ọbụla unu rifọrọ, hapụnụ ya ka ọ bụrụ nri unu ga-eri echi.’ ”
EXO 16:24 Ha mere dịka Mosis gwara ha. Mgbe chi echi bọrọ, ha chọpụtara na nri ha dị mma dịkwa ụtọ, ikpuru adịghịkwa nʼime ya.
EXO 16:25 Mosis gwara ha sị, “Nke a ga-abụ ihe oriri unu taa, nʼihi na ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị. Ọ dịghị nri unu ga-ahụ nke unu ga-achịkọta taa.
EXO 16:26 Abalị isii ka unu ga-achịkọta nri unu ga-eri. Ma nʼabalị nke asaa bụ ụbọchị izuike, unu agaghị ahụ nri unu ga-achịkọta.”
EXO 16:27 Ụfọdụ lefuru ọkwa ahụ Mosis maara ha anya. Ha pụrụ nʼụbọchị izuike ahụ ịchọ nri, ma o nweghị nke ha nwetara.
EXO 16:28 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-enupu isi nʼiwu m na ịdọ aka na ntị m?
EXO 16:29 Lee, Onyenwe anyị enyela unu ụbọchị izuike. Ya mere, nʼụbọchị nke isii ọ na-enye unu nri ga-ezuru unu abalị abụọ. Onye ọbụla nʼime unu kwesiri ịnọgide nʼụlọ unu. Unu ekwesighị ịpụ apụ.”
EXO 16:30 Nʼihi nke a, ndị Izrel niile zuru ike nʼụbọchị nke asaa.
EXO 16:31 Ndị Izrel kpọkwara aha nri ahụ ha na-achịkọta mánà. Ọ dị ọcha dịka mkpụrụ kọrianda. Ọ na-atọkwa ụtọ dịka achịcha e ji mmanụ aṅụ mee.
EXO 16:32 Emesịa, Mosis gara nʼihu gwa ha okwu sị, “Onyenwe anyị enyela iwu sị, ‘Na unu ga-eji ihe ọtụtụ ọmaa tụpụta mánà nke unu ga-edebe. Ọ ga-abụ ihe ncheta ga-adịrị ọgbọ ndị Izrel niile na-abịa nʼihu. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ unu ga-ahụ ụdị achịcha m jiri zụọ unu nʼime ọzara mgbe m gbapụtara unu site nʼala ndị Ijipt.’ ”
EXO 16:33 Nʼihi nke a, Mosis nyere Erọn iwu sị ya, “Tụrụ ọtụtụ ọmaa mánà tinye ya nʼime ite nta. Bute ya debe ya nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ ihe ga-adịgide nye ọgbọ dị nʼihu.”
EXO 16:34 Emesịa, Erọn dọnyere mánà a nʼihu Ihe Ama e debere nʼime ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
EXO 16:35 Ndị Izrel niile riri mánà ndị a iri afọ anọ tutu ruo mgbe ha batara nʼala ebe ndị mmadụ bi, tutu ruo mgbe ha bịarutere nʼoke ala Kenan.
EXO 16:36 (Ihe ọtụtụ ọmaa bụ otu ọtụtụ nʼime ọtụtụ iri nke ga-eju ihe ọtụtụ efaf.)
EXO 17:1 Ọgbakọ ụmụ Izrel niile sitere nʼọzara Sin bilie ije ha, na-aga site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Ha mara ụlọ ikwu ha na Refidim, ma ọ dịghị mmiri dị nke ndị mmadụ ga-aṅụ.
EXO 17:2 Nʼihi nke a, ha sesịrị Mosis okwu, sị, “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.” Mosis zara, sị, “Gịnị mere unu ji esesị m okwu? Gịnị mere unu ji chọọ ịnwapụta ntachiobi Onyenwe anyị?”
EXO 17:3 Ma akpịrị mmiri kpọrọ ndị a nkụ nʼebe ahụ, nke a mere ka ha tamuo ntamu megide Mosis. Ha sịrị, “Ọ bụkwa nʼihi gịnị ka i ji site nʼobodo Ijipt kpọpụta anyị, ime ka anyị, ụmụntakịrị anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ?”
EXO 17:4 Nʼihi ya, Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Gịnị ka m ga-eme banyere ndị a. Lee, ha chọrọ itugbu m na nkume.”
EXO 17:5 Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis, sị ya, “Gaa nʼihu ndị a, kpọrọ ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel. Jirikwa mkpanaka ahụ nʼaka gị, bụ nke i tiri nʼelu osimiri Naịl gaa.
EXO 17:6 Lee, Aga m eguzo nʼihu gị nʼakụkụ nkume dị na Horeb. Ị ga-akụ mkpara gị nʼelu nkume ahụ. Mmiri ga-asọpụtakwa site na ya, ka ndị mmadụ ṅụọ.” Ya mere, Mosis mere otu a nʼihu ndị okenye Izrel niile.
EXO 17:7 Nʼihi nke a, ọ kpọrọ aha ebe ahụ Masa na Meriba nʼihi esemokwu ụmụ Izrel na nʼihi nwale ha nwalere Onyenwe anyị, na-asị, “Onyenwe anyị ọ nọnyeere anyị, ka ọ bụ na ọ nọnyereghị anyị?”
EXO 17:8 Ndị Amalek bịara lụso ụmụ Izrel agha na Refidim.
EXO 17:9 Mosis gwara Joshua okwu sị ya, “Họpụta ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa lụso ndị Amalek agha. Echi, mụ onwe m ga-eguzoro nʼelu ugwu, jidekwa mkpara Chineke nʼaka m.”
EXO 17:10 Ya mere, Joshua pụrụ gaa lụso ndị Amalek agha dịka Mosis gwara ya. Ma Mosis na Erọn na Hua, rigoro nʼelu ugwu ahụ.
EXO 17:11 Ndị Izrel na-enwe mmeri mgbe ọbụla Mosis weliri aka ya elu, ma ndị Amalek na-emeri mgbe ọbụla Mosis wedatara aka ya.
EXO 17:12 Mgbe ike gwụrụ aka Mosis, ha butere nkume tinye nʼokpuru ya mee ka ọ nọkwasị nʼelu ya. Erọn na Hua jidere aka Mosis abụọ welie ya elu, otu onye nʼakụkụ a, onye nke ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ. Ime ka aka Mosis guzosie ike tutu ruo mgbe anwụ dara.
EXO 17:13 Nʼihi nke a, Joshua na ndị agha ya meriri ndị agha Amalek site nʼiji mma agha gbuo ha.
EXO 17:14 Emesịa, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Dee ihe niile ndị a nʼakwụkwọ, ka ọ bụrụ ihe ncheta. Gụgharịakwa ya na ntị Joshua. Nʼihi na aga m ehichapụ ihe niile a ga-eji cheta Amalek nʼelu ụwa.”
EXO 17:15 Mosis wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. Ọ kpọrọ ya Onyenwe anyị Nisi, nke pụtara, Onyenwe anyị bụ ọkọlọtọ m.
EXO 17:16 Mosis sịrị, “Nʼihi na-eweliri aka elu nʼebe ocheeze Onyenwe anyị dị. Onyenwe anyị ga na-ebuso ndị Amalek agha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
EXO 18:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jetro, nna nwunye Mosis, onye bụkwa onye nchụaja Midia, nụrụ banyere ihe niile Chineke meere Mosis na Izrel ndị nke ya, na ụzọ Onyenwe anyị si napụta Izrel site nʼaka ndị Ijipt.
EXO 18:2 Jetro ọgọ nwoke Mosis kpọọrọ Zipọra, nwunye Mosis, mgbe Mosis chụlara ya
EXO 18:3 na ụmụ ya ndị ikom abụọ. Aha nwa ya nke mbụ bụ Geshọm, nke pụtara, abụ m ọbịa na mba ọzọ.
EXO 18:4 Aha nwa nwoke nke abụọ bụ Elieza, nke bụ, Onyenwe anyị bụ onye inyeaka m. Nʼihi na mgbe Mosis mụrụ Elieza o kwuru sị, “Chineke nna m bụ onye inyeaka m, nʼihi na ọ napụtara m site na mma agha Fero.”
EXO 18:5 Jetro, ọgọ nwoke Mosis, bịakwutere ha nʼime ọzara. O dutere ụmụ ndị ikom Mosis abụọ na nwunye Mosis. Nʼoge ahụ, Mosis na ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu Chineke.
EXO 18:6 O ziri Mosis ozi sị, “Mụ bụ Jetro ọgọ gị nwoke bịakwutere gị, nwunye gị na ụmụ gị abụọ sokwa m.”
EXO 18:7 Nʼihi ya, Mosis gara zute ọgọ ya nwoke, kpọọ isiala nye ọgọ ya, sutu ya ọnụ. Emesịa, ọ kpọbatara ha nʼime ụlọ ikwu ya. Jetro na ọgọ ya Mosis kwurịtara okwu, jụọ ihe banyere otu ihe si agara ibe ha.
EXO 18:8 Mosis kọọrọ nna nwunye ya ihe niile Onyenwe anyị mere Fero na ndị Ijipt niile nʼihi ndị Izrel. Ọ kọkwaara ya banyere ihe ndakwasị niile dakwasịrị ha nʼime ọzara, na otu Onyenwe anyị si napụta ha.
EXO 18:9 Jetro soro Mosis ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu nʼihi ihe niile Onyenwe anyị meere ndị Izrel, na otu o siri napụta ha site nʼaka ndị Ijipt.
EXO 18:10 Jetro kwuru sị, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ. Onye napụtara unu site nʼaka ndị Ijipt na site nʼaka Fero.
EXO 18:11 Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị kachasị chi ndị ọzọ niile elu, nʼihi na ọ zọpụtara ndị ya site nʼaka ndị Ijipt ndị sitere na mpako ha meso Izrel mmeso.”
EXO 18:12 Jetro, nna nwunye Mosis chụọrọ Chineke aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ. Emesịa, Erọn na ndị okenye Izrel bịara soro Mosis na ọgọ ya nwoke rie ihe nʼihu Chineke.
EXO 18:13 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, Mosis bịara nọdụ ala ikpere ndị mmadụ ikpe. Igwe mmadụ nọgidere Mosis site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị.
EXO 18:14 Ọgọ Mosis hụrụ ihe niile ọ na-emere ndị mmadụ, nke a mere na ọ jụrụ, “Gịnị bụ ihe nke a ị na-emere ndị a? Gịnị mere i ji nọdụ ala naanị gị, ndị a niile gbaa gị gburugburu malite nʼụtụtụ ruo nʼanyasị?”
EXO 18:15 Mosis zara nna nwunye ya sị, “Nʼihi na ha bịara ịjụta m ihe si nʼaka Chineke.
EXO 18:16 Ọ bụrụ na esemokwu adịrị nʼetiti mmadụ ọbụla na ibe ya, ha na-abịakwute m, ka m kpebie ihe dị nʼetiti mmadụ na ibe ya. Ana m eme ka ha mata iwu na ụkpụrụ Chineke.”
EXO 18:17 Mgbe Jetro, nna nwunye Mosis, nụrụ ihe ndị a niile, ọ sịrị Mosis, “Ihe ị na-eme adịghị mma.
EXO 18:18 Ike ga-agwụ gị, gwụkwa igwe mmadụ ndị a. Ọrụ a ị na-arụ dị ukwuu karịa gị. Naanị gị agaghị ebuli ya.
EXO 18:19 Ugbu a, gee m ntị. M ga-adụ gị ọdụ, ka Chineke nọnyekwara gị. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-anọchi anya ndị a nʼihu Chineke. Nʼụzọ dị otu a, i nwere ike iweta nsogbu niile ha nwere nʼihu Chineke.
EXO 18:20 Ihe ọzọ ị ga-eme bụ nke a: ị ga-akụziri ha iwu na ụkpụrụ Chineke, gosikwa ha ụzọ ha ga-esi bie ndụ, na ọrụ ha kwesiri ịrụ.
EXO 18:21 Ma site nʼetiti ndị a họpụta ndị ikom tozuru, ndị ikom na-atụ egwu Chineke, ndị kwesiri ntụkwasị obi na ndị kpọrọ uru nʼezighị ezi asị. Mee ha ndịisi na-achị imerime puku ndị mmadụ, ndịisi narị mmadụ, ndịisi iri mmadụ ise na ndịisi mmadụ iri.
EXO 18:22 Mee ka ha bụrụ ndị ikpe nye ndị mmadụ oge niile. Nye iwu ka ha na-ewetara gị okwu dịkarịsịrị ike, ma na-ekpe ikpe gbasara okwu dị mfe na ndị ọzọ niile dị iche iche. Nʼụzọ dị otu a, ndị ikpe ndị ahụ ga-enyere gị aka ime ka ibu arọ gị dị mfe.
EXO 18:23 Ọ bụrụ na ị ga-eme ihe niile ndị a, ọ bụrụkwa na Chineke ekwenye, ị ga-enwe ike nagide nsogbu niile. Mmadụ niile ga-ewere udo na ọṅụ birikwa.”
EXO 18:24 Mosis gere ntị nʼihe niile nna nwunye ya gwara ya. O mekwara ihe niile o kwuru.
EXO 18:25 O sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta ndị kwesiri ekwesi mee ka ha bụrụ ndịisi. Ụfọdụ ka o mere ndịisi na-elekọta imerime puku mmadụ, ụfọdụ na-achị narị mmadụ, ụfọdụ, iri mmadụ ise, ụfọdụ, mmadụ iri.
EXO 18:26 Ha jere ozi dịka ndị ikpe nye ndị mmadụ nʼoge niile. Ha na-ewetara Mosis okwu niile siri ike, ma ha onwe ha na-ekpe ikpe banyere okwu nke dịkarịsịrị nta.
EXO 18:27 Mgbe ahụ, Mosis zilagara nna nwunye ya. Jetro laghachikwara nʼobodo nke aka ya.
EXO 19:1 Nʼọnwa nke atọ, site nʼoge ndị Izrel hapụchara obodo Ijipt, nʼụbọchị ahụ, ha bịaruru ọzara Saịnaị.
EXO 19:2 Ọ bụ site na Refidim ka ha sị bịaruo ọzara Saịnaị, mee ebe obibi ha nʼebe ahụ, nʼakụkụ ugwu Saịnaị.
EXO 19:3 Mosis rigooro nʼelu ugwu ahụ izute Chineke. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼelu ugwu ahụ kpọ Mosis oku sị ya, “Otu a ka ị ga-esi gwa ụlọ Jekọb okwu. Ị ga-akọrọ ụmụ Izrel:
EXO 19:4 ‘Unu onwe unu ahụla ihe m mere ndị Ijipt, hụkwa otu m siri buru unu na nku ugo, si otu a, dọtara unu onwe m.
EXO 19:5 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m,
EXO 19:6 ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ Okwu ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.”
EXO 19:7 Mosis gara kpọkọta ndị okenye ndị Izrel, gwa ha okwu niile nke Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
EXO 19:8 Ndị mmadụ niile a jikwa otu olu zaghachi ya sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị kwuru ka anyị ga-eme.” Mosis gwara Onyenwe anyị ihe niile ndị Izrel kwuru.
EXO 19:9 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee, agaje m izute gị nʼime igwe ojii gbara ọchịchịrị. Achọrọ m ka ụmụ Izrel niile were ntị ha nụrụ mgbe m ga-agwa gị okwu, ọzọkwa, ka ha kwerekwa na gị ruo mgbe niile.” Mosis gwara ndị Izrel niile okwu nke Onyenwe anyị gwara ya.
EXO 19:10 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị, “Rịdakwuru ndị m, doo ha nsọ taa na echi. Nʼihi na nke a ga-abụ nkwado ha izute m. Ka ha saa uwe ha mmiri,
EXO 19:11 jikerekwa nʼụbọchị nke atọ. Nʼihi na m ga-arịdata nʼelu ugwu Saịnaị nʼihu mmadụ niile.
EXO 19:12 Ị ga-akpa oke nʼebe ha na-agaghị agafe. Nye ha iwu si ha, ‘Kpacharanụ anya ka unu ghara ịbịa ugwu ahụ nso, maọbụ metụ ala ugwu ahụ aka. Nʼihi na onye ọ bụla metụrụ ugwu ahụ aka aghaghị ịnwụ.’
EXO 19:13 Agaghị emetụ onye mmebi iwu ahụ aka, kama, a ga-eji nkume tugbuo ya, maọbụ e were àkụ gbagbuo ya, maọbụ mmadụ maọbụ anụmanụ, ọ gaghị adị ndụ. Mmadụ ọbụla agaghị abịaru ugwu ahụ nso, ruo mgbe ha nụrụ opi nke a ga-afụ. Mgbe ahụ, ha nwere ike bịa nso ugwu ahụ.”
EXO 19:14 Ya mere, Mosis si nʼugwu ahụ rịdakwuru ụmụ Izrel. O doo ndị mmadụ ahụ nsọ. Ha niile ji mmiri saa uwe ha.
EXO 19:15 Mosis dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Jikerenụ nʼụbọchị nke atọ. Nwoke na nwanyị enwekwala mmekọrịta ọbụla.”
EXO 19:16 Mgbe o ruru nʼụtụtụ ụbọchị nke atọ ahụ, oke igwe ojii kpuchiri elu ugwu ahụ. Amụma malitere na-egbuke, egbe eluigwe malitekwara ịgba. Nʼikpeazụ, opi ike dara. Mmadụ niile tụrụ egwu, makwa jijiji.
EXO 19:17 Mosis duuru ndị mmadụ ahụ niile si nʼụlọ ikwu ha pụta gaa izute Chineke. Ha niile guzokwara nʼala ugwu ahụ.
EXO 19:18 Mgbe ahụ, anwụrụ ọkụ kpuchiri ugwu Saịnaị. Ma lee! Onyenwe anyị rịdatara dịka ire ọkụ nʼelu ugwu ahụ. Anwụrụ ọkụ rigoro elu dịka anwụrụ ọkụ nke ọhịa na-ere ọkụ. Ala ọma jijiji dị ukwuu dakwasịkwara ugwu ahụ.
EXO 19:19 Mgbe opi ike ahụ na-ada ike ike, Mosis malitere ịgwa Chineke okwu. Chineke zaghachiri Mosis okwu site nʼolu dara ụda dịka egbe eluigwe.
EXO 19:20 Onyenwe anyị rịdatara bịaruo nʼelu ugwu Saịnaị. Ọ gwara Mosis ka ọ rịgota bịa zute ya. Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ ijekwuru Chineke.
EXO 19:21 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rịda gaa dọọ ndị mmadụ ahụ aka na ntị ka ha ghara ịgafe oke ala ahụ bịaruo nso ịhụ Onyenwe anyị anya ka ha ghara ịla nʼiyi.
EXO 19:22 Ọ bụladị ndị nchụaja ndị chọrọ ịbịaru Onyenwe anyị nso aghaghị ido onwe ha nsọ. Ma ọ bụghị otu a, Onyenwe anyị ga-eme ka ha niile nwụọ.”
EXO 19:23 Mosis zaghachiri Onyenwe anyị sị, “Ndị mmadụ agaghị arịgota nʼugwu Saịnaị nʼihi na gị onwe gị adọọla anyị aka na ntị sị, ‘Kpaanụ oke gburugburu ugwu a, doo ya nsọ.’ ”
EXO 19:24 Ma Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị: “Gbada gaa kpọgota Erọn ka gị na ya soro rigota nʼelu ugwu a. Ma lezie anya ka ndị nchụaja na ndị Izrel ghara irigota nʼebe a ịbịakwute Onyenwe anyị, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-eji ike laa ha nʼiyi.”
EXO 19:25 Ya mere, Mosis rịdakwuru ndị Izrel ga gwa ha.
EXO 20:1 Chineke kwuru okwu ndị a niile sị:
EXO 20:2 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ibu ohu.
EXO 20:3 “Ị gaghị enwe chi ọzọ tinyere m.
EXO 20:4 Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, nʼoyiyi nke ụdị ọbụla nke yiri ihe dị nʼeluigwe maọbụ nke yiri ihe dị nʼụwa, nʼokpuru ya maọbụ nʼime mmiri, nʼokpuru ụwa.
EXO 20:5 Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị.
EXO 20:6 Ma na egosi ịhụnanya nye puku ọgbọ niile nke ndị hụrụ m nʼanya, bụ ndị na-edebe ihe niile m nyere nʼiwu.
EXO 20:7 Gị ejikwala aha Onyenwe anyị bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị.
EXO 20:8 Cheta ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ.
EXO 20:9 Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile.
EXO 20:10 Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọbụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị.
EXO 20:11 Nʼihi na ọ bụ nʼime ụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha. O zuru ike nʼụbọchị nke asaa. Nʼihi nke a Onyenwe anyị gọziri ụbọchị nke asaa doo ya nsọ, ka ọ bụrụ ụbọchị izuike.
EXO 20:12 Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
EXO 20:13 Gị egbula mmadụ.
EXO 20:14 Gị akwala iko.
EXO 20:15 Gị ezula ohi.
EXO 20:16 Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị.
EXO 20:17 Gị enwela anya ukwu nʼebe ụlọ onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị, maọbụ ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi gị nwere dị.”
EXO 20:18 Mgbe ndị Izrel hụrụ egbe eluigwe, na amụma ọkụ, na opi ike, hụkwa ugwu ahụ ka o jupụtakwara nʼanwụrụ ọkụ, ha mara jijiji nʼihi egwu. Ha guzoro nʼebe dị anya,
EXO 20:19 sị Mosis, “Biko ka gị onwe gị gwa anyị okwu, anyị ga-anụ ma ka Chineke gharakwa ịgwa anyị okwu, ma ọ bụghị ya, anyị ga-anwụ.”
EXO 20:20 Mosis sịrị ndị Izrel, “Unu atụkwala ụjọ, nʼihi na Chineke bịara ịnwale unu ime ka unu na-atụ ya egwu mgbe ọbụla ka unu ghara imehie megide ya.”
EXO 20:21 Nʼihi nke a, mmadụ niile guzoro nʼebe dị anya site nʼugwu ahụ. Ma Mosis bara nʼime igwe ojii ahụ, ebe Chineke nʼonwe ya nọ.
EXO 20:22 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị, ‘Unu onwe unu ahụla na m si nʼeluigwe gwa unu okwu.
EXO 20:23 Unu emerela onwe unu chi ọzọ tinyere m, chi ọlaọcha maọbụ chi ọlaedo. Unu emerela onwe unu ha.
EXO 20:24 “ ‘Ebe ịchụ aja unu ga-ewuru m ga-abụ nke unu ji naanị aja wuo. Nʼebe ahụ ka unu ga-achụrụ m aja nsure ọkụ na aja udo. Unu ga-ejikwa igwe ewu na atụrụ, na ehi chụọrọ m aja. Unu ga-ewuru m ebe ịchụ aja naanị ebe ọbụla m mere ka aha m bụrụ ihe a na-asọpụrụ, nʼebe ahụ ka m ga-abịa gọzie unu.
EXO 20:25 Ọ bụrụ na unu ewuo ebe ịchụ aja nkume, unu ejikwala nkume a wara awa, nʼihi na unu ga-eme ka ọ ghara ịdị nsọ ma ọ bụrụ na unu ejiri ngwa ọrụ wagharịa nkume ya.
EXO 20:26 Unu ejila ihe nrigo gbagoro nʼebe ịchụ aja m, ka a ghara ikpughe ọtọ unu nʼelu ya.’
EXO 21:1 “Ndị a bụ iwu ị ga-edebe nʼihu ha.
EXO 21:2 “Ọ bụrụ na ị goro ohu onye Hibru, ọ ga-agbara gị odibo afọ isii. Ma nʼafọ nke asaa, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya laakwa nʼakwụghị ụgwọ ọbụla.
EXO 21:3 Ọ bụrụ na sọọsọ ya bịara, sọọsọ ya ga-ala, ma ọ bụrụ na o nwere nwunye tupu ọ bụrụ ohu, ya na nwunye ya ga-eso ala.
EXO 21:4 Ọ bụrụ na nna ya ukwu kpọnyere ya nwunye onye mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, nwanyị ahụ na ụmụ ya ga-abụ nke nna ya ukwu, naanị nwoke ahụ ga-enwere onwe ya.
EXO 21:5 “Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị, nʼezie, ‘Ahụrụ m onyenwe m na nwunye m na ụmụ m nʼanya, achọghị m inwere onwe,’
EXO 21:6 mgbe ahụ, onyenwe ya ga-eduru ya bịakwute Chineke. Mgbe ọ kpọbatasịrị ya nʼọnụ ụzọ, onyenwe ya ga-eji agịga dupuo ntị ya. Malite nʼoge ahụ, ọ ga-abụkwa ohu ya ruo ọgwụgwụ ndụ ya.
EXO 21:7 “A sị na nwoke eree nwa ya nwanyị dịka ohu, agaghị ala otu ndị ohu nwoke si ala.
EXO 21:8 Ọ bụrụ na ihe nwanyị ahụ amasịkwaghị onyenwe ya, onye họọrọ ya nye onwe ya, onyenwe ya ga-ekwere ka a gbapụta ya. Ma ọ gaghị eresi ya ndị ọbịa. Nʼihi na onyenwe ya emeela nwanyị ahụ ihe ọjọọ mgbe ọ jụrụ na ọ gaghị alụkwa ya ọzọ.
EXO 21:9 Ọ bụrụ na ọ chọrọ ka nwa ya nwoke lụọ ya dịka nwunye ya, ọ ga-emeso ya dịka omenaala si kwado e si emeso ndị bụ nwaada.
EXO 21:10 Ọ bụrụkwa na ọ lụta ya dịka nwunye nke aka ya, mesịakwa lụta nwunye ọzọ, ọ gaghị akwụsị inye ya uwe maọbụ ihe oriri. Ọ gaghị agọnarịkwa ya ihe ọbụla kwesiri ya dịka nwunye.
EXO 21:11 Ọ bụrụ na o mereghị ohu nwanyị a ihe ndị a, nwanyị a pụrụ ịhapụ ya gaara onwe ya na-akwụghị ụgwọ ọbụla. Mgbe ahụ, ọ ga-enwerekwa onwe ya.
EXO 21:12 “Ọzọkwa, ọ bụrụ na mmadụ etigbuo mmadụ ibe ya, aghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ.
EXO 21:13 Ma ọ bụrụ na o mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụkwa na Chineke kwagidere omume dị otu a, mgbe ahụ, a ga-ahọpụtara ya ebe ọ ga-agbaga, jee zere ndụ.
EXO 21:14 Ọ bụrụkwa na onye ọbụla akpachara anya jiri aghụghọ gbuo mmadụ ibe ya, a ga-adọpụta ya, ọ bụladị site nʼebe ịchụ aja m, gbuo ya.
EXO 21:15 “Ọ bụrụ na onye ọbụla etie nna ya maọbụ nne ya ihe, a ghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ.
EXO 21:16 “Onye ọbụla tọọrọ mmadụ ibe ya, ma o rere ya nʼahịa, maọbụ na a chọpụtara ya nʼaka ya, a ga-eme ka onye dị otu a nwụọ.
EXO 21:17 “Aghaghị ime ka onye ọbụla ga-akpọ nna ya maọbụ nne ya iyi nwụọ.
EXO 21:18 “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ alụọ ọgụ ma otu nʼime ha ewere nkume maọbụ osisi tie onye nke ọzọ. Ọ bụrụ na ọ nwụghị, kama na o merụrụ ahụ, dinaakwa nʼihe ndina ya,
EXO 21:19 ọ bụrụ na onye ahụ ebilie were mkpara ya na-ejegharị, ikpe agaghị ama onye ahụ tiri ya ihe, kama ọ ga-akwụ ụgwọ ihe onye ahụ ji gwọọ onwe ya, na oge onye ahụ o tiri ihe ji nọọ nʼihe ndina, ruo mgbe ahụ ya ga-adị mma.
EXO 21:20 “Ọ bụrụ na ohu ọbụla anwụọ site nʼihe otiti nke onyenwe ya tiri ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, a ga-adọ onyenwe ya aka na ntị site nʼinye ya ntaramahụhụ.
EXO 21:21 Otu ọ dị, ọ bụrụ na ohu ahụ dị ndụ nʼụbọchị mbụ, maọbụ nʼụbọchị nke abụọ, a gaghị enye onyenwe ya ntaramahụhụ nʼihi na ohu ahụ bụ akụ ya.
EXO 21:22 “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ esite nʼịlụ ọgụ ha merụọ nwanyị dị ime ahụ, mee ka ime ahụ pụọ, ma nwanyị ahụ emerụghị nnukwu ahụ, di nwanyị ahụ ga-anara site nʼaka onye ahụ merụrụ nwunye ya ahụ ihe niile ọbụla o kwuru na a ga-akwụ ya, bụkwa nke ndị na-ekpe ikpe kpebiri.
EXO 21:23 Ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ a nwụọ nʼihi mmerụ ahụ ahụ e merụrụ ya, a ga-eme ka nwoke ahụ merụrụ ya ahụ nwụọ.
EXO 21:24 Ọ bụrụ na ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze. Otu ahụ kwa, aka nʼọnọdụ aka, ụkwụ nʼọnọdụ ụkwụ.
EXO 21:25 Ịda ọkụ nʼọnọdụ ịda ọkụ, ọnya mma, nʼọnọdụ ọnya mma, ihe otiti nʼọnọdụ ihe otiti.
EXO 21:26 “Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla esite nʼihe otiti o tiri ohu ya kụkpọọ ya anya, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya, maọbụ ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, nʼihi na o jirila anya ya gbara onwe ya.
EXO 21:27 Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla etipụ eze ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya nʼihi eze ya nke e tipụrụ.
EXO 21:28 “Ọ bụrụ na ehi ejiri mpi ya sọda mmadụ si otu a mee ka onye ahụ nwụọ, a ga-atụgbu ehi ahụ na nkume. Mmadụ ọbụla agaghị erikwa anụ ehi ahụ. Ma a ga-agụ onyenwe ehi ahụ dịka onye ikpe na-amaghị.
EXO 21:29 Ọ bụrụ na ehi ahụ na-asọkarị ndị mmadụ mpi mgbe niile, agaghị eri anụ ya. Kama, ọ bụrụ na adọọla onyenwe ya aka na ntị banyere ehi ahụ ọtụtụ oge, ma o meghị ihe ọbụla banyere ya, a ga-eme ka ehi ahụ na onyenwe ya nwụọ.
EXO 21:30 Ma ọ bụrụ na ndị nwe mmadụ achọọ ka a kwụọ ha ụgwọ kama igbu onyenwe ehi ahụ, ndị ikpe ga-ekpebi ego ole onyenwe ehi ga-akwụ ha.
EXO 21:31 Otu a ka a ga-esikwa kpee ikpe nke ga-apụta ma ọ bụrụ na ehi asọda nwokorobịa maọbụ nwaagbọghọ ọbụla.
EXO 21:32 Kama ọ bụrụ na ehi asọda ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, onyenwe ehi ahụ ga-akwụ onyenwe ohu ahụ iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. Emesịa, a ga-eji nkume tugbuo ehi ahụ.
EXO 21:33 “Ọ bụrụ onye ọbụla meghere olulu maọbụ gwuo olulu, ghara imechi ya, nke mere na ehi mmadụ maọbụ ịnyịnya ibu adaba nʼime ya,
EXO 21:34 onye ahụ gwuru olulu ahụ ga-akwụ onyenwe anụ ụlọ ahụ ọnụọgụgụ ego o jiri zụta ya. Mgbe ahụ ọ ga-eburu ozu anụ ahụ nwụrụ anwụ.
EXO 21:35 “Ọ bụrụ na oke ehi mmadụ emerụọ oke ehi onye ọzọ ahụ, emesịa ehi dị otu a anwụọ, a ga-ere ehi nke dị ndụ, kewaa ego ya ụzọ abụọ. Otu a kwa, a ga-ekewa ehi nke nwụrụ anwụ, nye mmadụ abụọ ahụ otu ụzọ otu ụzọ.
EXO 21:36 Ọ bụrụ na amaara na oke ehi ahụ na-asọ mpi mgbe niile nʼoge gara aga, ma onyenwe ya emeghị ihe ọbụla banyere ya, ọ ga-akwụzu ụgwọ ehi ahụ nwụrụ anwụ. Emesịa ehi ahụ nwụrụ anwụ ga-abụrụ nke ya.
EXO 22:1 “Ọ bụrụ na mmadụ ezuru ehi maọbụ atụrụ gbuo ya, maọbụ ree ya, ọ ga-akwụghachi ehi ise nʼọnọdụ ehi ahụ. Nʼọnọdụ otu atụrụ o zuuru, ọ ga-akwụghachi atụrụ anọ.
EXO 22:2 “Ọ bụrụ na e jide onye ohi mgbe ọ na-egbuka ụlọ onye ọzọ, ọ bụrụkwa na e tigbuo ya, mee ka ọ nwụọ, iwu ejideghị onye ahụ gburu ya.
EXO 22:3 Kama ọ bụrụ na e tigburu onye ahụ mgbe chi bọcharala, ọmụma ikpe ga-adịrị onye ahụ tigburu ya. “Ọ bụrụ na e jide onye ohi, a ga-eme ka ọ kwụghachi ihe o zuru nʼohi. Ọ bụrụ na o nweghị ike kwụghachi, a ga-ere ya dịka ohu, jiri ego e retara kwụọ ụgwọ o ji.
EXO 22:4 Ọ bụrụ na a chọta ihe o zuru nʼaka ya, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, ọ ga-akwụghachi ọnụahịa ya okpukpu abụọ.
EXO 22:5 “Ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya hapụ anụ ụlọ ya ka ọ gaa taa nri nʼubi maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ nʼubi onye ọzọ, onyenwe anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ihe niile anụ ụlọ ya mebiri, ma ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ aghaghị ịbụ ihe ọrụ ubi dị mma nke o si nʼubi ya maọbụ nʼubi vaịnị ya wepụta.
EXO 22:6 “Ọ bụrụ na ọkụ na-agba banye nʼogwu, repịa ogbo ọka dị nʼubi mmadụ maọbụ ọka guzoro eguzo, ma ọ bụkwanụ ọhịa niile, onye ahụ tinyere ọkụ ahụ ga-akwụghachi ụgwọ ihe ahụ niile nke ọkụ repịara.
EXO 22:7 “Ọ bụrụ na mmadụ enye enyi ya maọbụ onye agbataobi ya ego, maọbụ ihe ọbụla ka o debere ya, ma onye ohi agaa zuru ya site nʼụlọ ya, a si na e jide onye ohi dị otu a, ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe o zuru okpukpu abụọ.
EXO 22:8 Ọ bụrụ na a chọpụtaghị onye ohi ahụ, onye nwe ụlọ ahụ aghaghị ịbịa nʼihu Chineke, ka a chọpụta maọbụ ya nʼonwe ya setịpụrụ aka were ihe ahụ, bụ akụ nke onye ọzọ kpatara.
EXO 22:9 Ọ bụrụ na onye ehi ya, maọbụ ịnyịnya ibu ya, maọbụ atụrụ ya, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla furu efu, nke mmadụ na-asị, ‘Nke a bụ ya.’ Mmadụ abụọ ndị a ga-aga nʼihu ndị ikpe. Onye ọbụla ndị ikpe a mara ikpe ga-akwụghachi ibe ya ụgwọ okpukpu abụọ.
EXO 22:10 “Ọ bụrụ na anụ ụlọ mmadụ nyere onye agbataobi ya nʼaka idebe anwụọ, maọbụ merụọ ahụ, maọbụ gbafuo, ma anụ ụlọ ahụ ọ bụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ anụ ụlọ ọzọ, ọ bụrụ na ọ dịghị onye hụrụ mgbe ihe ndị a dakwasịrị anụ ụlọ ahụ,
EXO 22:11 mgbe ahụ, onye agbataobi ahụ e nyere anụ ndị a nʼaka idebe ga-aṅụ iyi nʼihu Onyenwe anyị. Iyi ahụ ọ ṅụrụ ga-egosi onyenwe anụ ụlọ ahụ na o zughị ya nʼohi. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụghachi ụgwọ ọbụla.
EXO 22:12 Ma ọ bụrụ na o zuru anụ ụlọ ahụ nʼohi site na nke agbataobi ya, ọ ghaghị ịkwụghachi ụgwọ niile nye onyenwe ya.
EXO 22:13 Ọ bụrụ na anụ ọhịa gburu ya, ọ ga-eweta ụfọdụ nʼime anụ ahụ a dọgburu adọgbu, iji gosi na anụ ọhịa dọgburu ya. Ọ ga-esikwa otu a gbanarị ikpe ọmụma. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụkwa ụgwọ ọbụla nʼihi anụ ụlọ ahụ.
EXO 22:14 “Ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụ ụlọ site nʼaka onye agbataobi ya, ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ anwụọ, maọbụ merụọ ahụ mgbe onyenwe ya na-anọghị nʼebe ahụ, onye ahụ a gbazinyere anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ya.
EXO 22:15 Ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ nọ na nke onyenwe ya, onye gbaziri ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla. Ọ bụrụ na a kwụrụ ego mgbazi ọbụla nʼisi anụmanụ a, onye gbaziri ya agaghị akwụghachi ego ọbụla, nʼihi na ego mgbazi ọ kwuru ka a ga-ewere dịka ụgwọ.
EXO 22:16 “Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, site nʼime ka ha abụọ dinaa, nwoke ahụ ga-akwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. Ọ ga-alụkwa ya dịka nwunye ya.
EXO 22:17 Ọ bụrụ na nna nwaagbọghọ ahụ ekwenyeghị ka nwoke ahụ lụọ ya, nwoke ahụ aghaghị ịkwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ.
EXO 22:18 “E kwesighị ịhapụ nwanyị mgbaasị ndụ.
EXO 22:19 “Onye ọbụla ya na anụ ọbụla dinakọrọ, e kwesiri ime ka ọ nwụọ.
EXO 22:20 “Onye ọbụla chụrụ aja nye chi ọzọ ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị, a ga-eme ka ọ nwụọ.
EXO 22:21 “Ọ kwesighị ka mmadụ ọbụla mesie onye ọbịa ihe ike nʼụzọ ọbụla. Unu aghaghị icheta na unu bụ ndị ọbịa nʼala Ijipt.
EXO 22:22 “Unu emegbula nwanyị ọbụla di ya nwụrụ, maọbụ onye ọbụla na-enweghị nne na nna.
EXO 22:23 Unu megbuo ha, mee ka ha tikuo m, aga m anụ mkpu akwa ha, nyere ha aka.
EXO 22:24 Mgbe ahụ, iwe m dị oke ọkụ ga-eripịa unu. Aga m ejikwa mma agha tigbuo unu. Ndị nwunye unu ga-aghọkwa ndị inyom na-enweghị di, ụmụ unu ga-abụkwa ndị na-enweghị nna.
EXO 22:25 “Ọ bụrụ na ị gbazinyere onye Hibru ego, onye bụ nwa mgbei, ị gaghị anara ya ọmụrụnwa.
EXO 22:26 Ọ bụrụ na ị nara ya uwe ya nʼihi ego ahụ ị gbazinyere ya, ekwela ka uwe ahụ nọgide nʼaka gị ruo mgbe anwụ dara.
EXO 22:27 Nʼihi na uwe ahụ nwere ike bụrụ naanị ihe o nwere, maọbụ uwe ọ ga-eji rahụ ụra. Ọ bụrụ na i zighachighị ya, o tikuo m site nʼịkwa akwa, aga m anụrụ mkpu akwa ya, nʼihi na abụ m onye obi ebere.
EXO 22:28 “Ekwulula aha Chineke, abụkwala onye na-achị ndị gị ọnụ.
EXO 22:29 “Atụfukwala oge ọbụla nʼịkwụghachi onyinye unu kwesiri inye. Maọbụ nke mkpụrụ ala ubi gị, na nke mmanya vaịnị gị, na ụgwọ i kwesiri ịkwụ. “Ị ghaghị inye m nwa gị nwoke e buru ụzọ mụọ.
EXO 22:30 Otu a ka ị ga-emekwa banyere mkpụrụ mbụ nke ehi gị na atụrụ gị. Ị ga-ewebata ya nye m nʼụbọchị nke asatọ site nʼoge a mụrụ ha, mgbe ị hapụsịrị ha nne ha ụbọchị asaa.
EXO 22:31 “Unu ga na-abụrụ m ndị dị nsọ. Nʼihi nke a, wezuganụ onwe unu nʼebe anụ a dọgburu adọgbu dị. Unu erikwala anụ dị otu a, kama tụpụrụnụ ya nkịta.
EXO 23:1 “Ị gaghị agbasa akụkọ ụgha ọbụla. Esokwala mmadụ ọjọọ nwekọọ ihe ọbụla site nʼịgba ama ị maara na ọ bụghị eziokwu.
EXO 23:2 “Ị gaghị eso igwe mmadụ mee ihe ọjọọ. Mgbe ị na-agba akaebe nʼụlọikpe, ị gaghị esonye igwe mmadụ ndị na-atụgharị ikpe ziri ezi.
EXO 23:3 Nʼebe nwa ogbenye nọ, ị gaghị ekpelara ya nʼoge ikpe nʼihi na ọ bụ nwa ogbenye.
EXO 23:4 “Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu nke kpafuru akpafu, ọ bụrụkwa na ọ bụ nke onye iro gị, duru ya dulatara onye iro gị ahụ.
EXO 23:5 Ọ bụrụ na ị hụ onye kpọrọ gị asị ka ọ na-agbalị iwelite ịnyịnya ibu ya nke dara nʼihi ibu dị arọ o bu, elefula ya anya, kama gaa nyere ya aka bulite ịnyịnya ahụ.
EXO 23:6 “Ewezugala ikpe ziri ezi nʼebe ndị ogbenye nọ, nʼihi ọnọdụ ogbenye ha.
EXO 23:7 Ebola mmadụ ibe gị ebubo ụgha. Esonyekwala gbuo onye aka ya dị ọcha, maọbụ onye na-eme ihe ziri ezi. Nʼihi na mụ onwe m agaghị ahapụ onye na-emebi iwu na-ataghị ya ahụhụ kwesiri ya.
EXO 23:8 “Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.
EXO 23:9 “Abụkwala onye na-emegbu ndị ọbịa, nʼihi na ị maara ihe banyere ọnọdụ ndị ọbịa nke ọma. Gị onwe gị bụrịị ọbịa nʼIjipt.
EXO 23:10 “Afọ isi ka ị ga-agha mkpụrụ nʼala ubi gị, ghọọkwa ihe omume ya.
EXO 23:11 Ma nʼafọ nke asaa, arụla ọrụ ọbụla nʼala ahụ ọzọ, hapụ ka ala ahụ zuru ike. Mgbe ahụ ndị ogbenye nʼetiti unu ga-aga nʼebe ahụ weta ihe oriri. Mkpụrụ ndị ọzọ fọdụrụ ga-adịrị ụmụ anụ ọhịa dị iche iche. Iwu ndị a ga-adịrị ubi vaịnị na ubi oliv unu niile.
EXO 23:12 “Ị ga-arụ ọrụ gị niile nʼime ụbọchị isii. Ị ga-ezukwa ike nʼụbọchị nke asaa. Izuike a ga-adịkwara ehi gị na ịnyịnya ibu gị, na ndị ohu gị nọ nʼezinaụlọ gị na ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu.
EXO 23:13 “Kpachapụnụ anya hụ na unu mezuru ihe niile ndị a m gwara unu. Unu akpọkwala chi ndị ọzọ aha. Unu ekwupụtakwala ihe banyere ha nʼọnụ unu.
EXO 23:14 “Ugboro atọ nʼafọ ka unu ga-emere m mmemme a.
EXO 23:15 “Meenụ Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha nke e jighị ihe na-eko achịcha mee. Unu ga-eri ya na mgbe a kara aka, nʼọnwa Abib. Nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta. “Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu m.
EXO 23:16 “Mee Mmemme Owuwe Ihe ubi, bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ihe niile ị kụrụ nʼubi unu. “Meekwanụ Mmemme Nchịkọta Ihe, nʼọgwụgwụ afọ ọbụla. Mgbe unu si nʼubi na-achịbata mkpụrụ ubi unu niile.
EXO 23:17 “Ugbo atọ nʼafọ ka ndị ikom niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
EXO 23:18 “Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nʼihu m. “Maọbụ hapụ abụba nke aja mmemme m ka ọ dịgide ruo ụtụtụ.
EXO 23:19 “Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.
EXO 23:20 “Lee, ana m eziga mmụọ ozi nʼihu unu, ichebe unu nʼije unu nakwa ịkpọbatakwa unu nʼebe ahụ M doziri nye unu.
EXO 23:21 Geenụ ya ntị, nụrụkwa olu ya. Unu enupukwarala ya isi, nʼihi na ọ gaghị agbaghara njehie unu niile, nʼihi na Aha m dị nʼime ya.
EXO 23:22 Ọ bụrụ na unu elezie anya nke ọma, gee ya ntị, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu, mgbe ahụ, mụ onwe m ga-abụkwara ndị iro unu onye iro, megidekwa ndị na-emegide unu.
EXO 23:23 Mmụọ ozi m ga-ejekwa nʼihu unu, ịkpọbatakwa unu nʼala ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Aga m ehichapụ obodo ndị a niile.
EXO 23:24 Unu agaghị akpọ isiala nye chi ha niile. Unu efekwala ha, maọbụ gbasoro omenaala ha. Kama, kwatuonụ ha. Tipịasịakwanụ ebe nkume nsọ niile nke chi ha.
EXO 23:25 Ma unu ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Mgbe ahụ, ngọzị ya ga-adịkwasị nri unu na mmiri ọṅụṅụ unu. Aga m ewezugakwa ọrịa nʼetiti unu.
EXO 23:26 Nwanyị aga na nwanyị ime ya na-apụ agaghị adị nʼala unu. Aga m emekwa ka unu nwee ogologo ndụ.
EXO 23:27 “Aga m ezipu oke ụjọ m ka ọ nọrọ unu nʼihu tinye ọgbaaghara nʼime mba niile unu ga-ezute. Aga m eme ka ndị iro unu tụgharịa gbaa ọsọ.
EXO 23:28 Ọzọkwa, aga m eziga ebu ka ọ chụpụ ndị Hiv na ndị Kenan na ndị Het site nʼụzọ unu.
EXO 23:29 Ma agaghị m achụpụ ha nʼotu afọ, nʼihi na nke a ga-eme ka ala ahụ niile tọgbọrọ nʼefu, ụmụ anụ ọhịa a baa ụba karịa unu.
EXO 23:30 Ma aga m achụpụ ha nwantịntị nwantịntị, tutu ruo oge unu ga-adị ọtụtụ, mgbe ọnụọgụgụ unu ga-akarị nke ha ukwuu, mgbe unu ga-ejupụta ala ahụ niile.
EXO 23:31 “Aga m etinye oke ala unu site nʼOsimiri Uhie ruo nʼosimiri Mediterenịa, sitekwa nʼọzara ruo nʼosimiri Yufretis. Aga m enyefe ndị niile bi nʼala ahụ nʼaka unu. Unu ga-achụpụkwa ha.
EXO 23:32 Unu na ha agbala ndụ ọbụla. Unu na chi ha enwekwala mmekọ ọbụla.
EXO 23:33 Unu ekwela ka ha biri nʼala unu, ma ọ bụghị ya, ha ga-eme ka unu mehie megide m, nʼihi nʼife chi ha dị iche iche aghaghị ịbụrụ unu ihe ịma nʼọnya.”
EXO 24:1 Ọ gwara Mosis sị, “Rigokwute Onyenwe anyị, gị na Erọn, na Nadab, na Abihu, na mmadụ iri asaa site na ndị okenye Izrel. Ma unu ga-efe ofufe site nʼebe dị anya.
EXO 24:2 Emesịa, ọ bụ naanị Mosis ga-abịarute Onyenwe anyị nso. Ndị nke ọzọ agaghị abịaru nso. Ndị mmadụ ndị ọzọ agaghịkwa eso ya rigota.”
EXO 24:3 Mgbe ahụ, Mosis bịara gwa ndị Izrel okwu niile na iwu niile Onyenwe anyị nyere. Ha niile zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Anyị ga-emezu ihe niile Onyenwe anyị kwuru.”
EXO 24:4 Mosis deturu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Nʼisi ụtụtụ echi ya, o biliri wuo ebe ịchụ aja na ndịda ugwu ahụ. O gwunyere ogidi nkume iri na abụọ nke nọchiri anya ebo iri na abụọ ụmụ Izrel.
EXO 24:5 Mosis zipụtara ụmụ okorobịa Izrel, ndị chụrụ aja nsure ọkụ ma werekwa ụmụ oke ehi chụọ aja udo nye Onyenwe anyị.
EXO 24:6 Mosis tinyere ọkara ọbara ehi ndị ahụ nʼime efere. Ma o fesara ọkara ọbara nke fọdụrụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.
EXO 24:7 Emesịa, Mosis guzoro nʼebe ahụ gụpụta na ntị mmadụ niile, ihe dị nʼAkwụkwọ Ọgbụgba ndụ ahụ. Mgbe ụmụ Izrel nụrụ ya, ha weere otu olu kwuo sị, “Anyị anụla, anyị ga-eme ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Anyị ga-erube isi.”
EXO 24:8 Mgbe ahụ, Mosis weere ọbara ahụ dị nʼime efere, fesaa ya nʼahụ ndị ahụ niile, sị, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke dị nʼetiti unu na Onyenwe anyị, dịka okwu niile ndị a si dị.”
EXO 24:9 Mosis rigoro nʼelu ugwu, ya na Erọn, na Nadab na Abihu, na mmadụ iri asaa site na ndị okenye Izrel.
EXO 24:10 Ha hụrụ Chineke nke Izrel. Nʼokpuru ụkwụ ya abụọ, e were ihe dịka ebe nzọkwasị ụkwụ nke e ji nkume safaia mee. Nkume ndị a na-enwukwa ezi onwunwu dịka mbara eluigwe.
EXO 24:11 Ọ bụ ezie na ndị okenye Izrel hụrụ Chineke anya ma ọ laghị ha nʼiyi. Kama o mere ka ha nọọ nʼihu ya rie, ṅụọ.
EXO 24:12 Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rigota, bịakwute m nʼelu ugwu, nọdụkwa ebe ahụ, maka na aga m enye gị mbadamba nkume nke iwu na ụkpụrụ dị na ya, nke m ji aka m dee maka i ji kuziere ha.”
EXO 24:13 Mosis biliri, ya na Joshua onye na-agara ya ozi. Mosis nʼonwe ya rigokwara nʼelu ugwu Chineke.
EXO 24:14 Ọ gwara ndị okenye Izrel okwu sị, “Cherenụ anyị nʼebe a tutu ruo mgbe anyị ga-alaghachikwute unu. Unu na Erọn na Hua nọ, onye ọbụla nwere nsogbu jekwuru ha.”
EXO 24:15 Ngwangwa, Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ, oke igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ niile,
EXO 24:16 ebube Onyenwe anyị kpuchikwara elu ugwu ahụ. Ọ bụ ụbọchị isii ka igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ. Nʼụbọchị nke asaa, Onyenwe anyị sitere nʼetiti igwe ojii ahụ kpọọ Mosis oku.
EXO 24:17 Ma nʼebe ndị Izrel nọ, ebube Onyenwe anyị na-enwu dịka ọkụ na-achọ irechapụ ugwu ahụ.
EXO 24:18 Mosis banyere nʼime igwe ojii ahụ mgbe ọ na-arịgo ugwu ahụ. Ọ nọgidere nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
EXO 25:1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
EXO 25:2 “Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara m onyinye. Ị ga-anabatara m onyinye ahụ site nʼaka nwoke ọbụla onye o metụrụ nʼobi inye onyinye a.
EXO 25:3 “Ndị a bụ Onyinye ị ga-anata nʼaka ha: “ọlaọcha, ọlaedo na bronz.
EXO 25:4 Ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie, nke ezi akwa ọcha, na nke ajị ewu;
EXO 25:5 akpụkpọ anụ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri, na osisi akashia;
EXO 25:6 mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, ụda isi ụtọ a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;
EXO 25:7 nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi.
EXO 25:8 “Mee ka ha wuoro m ebe nsọ. Mụ onwe m ga-ebikwa nʼetiti ha.
EXO 25:9 Wuo ụlọ nzute a na ihe ịchọ ya mma niile, ka ọ bụrụ otu ihe dịka oyiyi m ga-egosi gị.
EXO 25:10 “Ha ga-eji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya ga-abụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya bụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ.
EXO 25:11 Machie ọlaedo a nụchara anụcha nʼime na azụ ya niile, jiri ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile.
EXO 25:12 Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnye ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya
EXO 25:13 Jirikwa osisi akashia mee mkpara ogologo. Emesịa, were ọlaedo machie mkpara ndị a.
EXO 25:14 Ị ga-etinye mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ, ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.
EXO 25:15 Nʼihi nke a, mkpara ọlaedo ndị ahụ ga-adịgide nʼime mgbaaka ọlaedo igbe a oge niile.
EXO 25:16 Ya mere, mgbe a rụsịrị igbe ọgbụgba ndụ ahụ, tinye Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime ya.
EXO 25:17 “Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ogologo ya ga-adị nzọ ụkwụ anọ. Obosara ya ga-abụ nzọ ụkwụ abụọ na ọkara.
EXO 25:18 Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ.
EXO 25:19 Rụọ otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; mee ka cherubim ndị a na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu na nsọtụ abụọ ahụ.
EXO 25:20 Cherubim ndị a ga-agbasa nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ ga-eche onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị.
EXO 25:21 Tụkwasị ihe mkpuchi ahụ nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Tinyekwa Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime igbe ahụ.
EXO 25:22 Nʼebe ahụ, nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ dị nʼelu ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ, ka m ga-ezute gị, nye gị iwu niile ị ga-enye ndị Izrel.
EXO 25:23 “Jiri osisi akashia mee tebul nke ogologo ya ga-adị iri sentimita itoolu. Obosara ya ga-abụ iri sentimita anọ na ise. Ịla elu ya ga-abụ iri sentimita isii na asaa.
EXO 25:24 Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha machie ya nke ọma, jirikwa ọlaedo kpụọ ọnụ ọnụ ya gburugburu.
EXO 25:25 Ị ga-etinye ihe njikọta a kpụrụ akpụ gburugburu ọnụ ọnụ ya, nke ga-aha ka otu ọbụ aka dimkpa. A ga-eji mpempe ọlaedo techie ihe njikọta ahụ gburugburu.
EXO 25:26 Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ, kwụnye ha nʼakụkụ anọ ahụ nke ụkwụ anọ ya.
EXO 25:27 Mgbaaka ndị ahụ ga-adị nso nso, ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, i ji ebu tebul ahụ.
EXO 25:28 Jiri osisi akashia mee mkpara a ga-eji na-ebu tebul ahụ. Jiri ọlaedo techie ha.
EXO 25:29 Ọzọkwa, jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ efere dị iche iche, na iko dị iche iche, na ọkwa dị iche iche, nke e ji awụpụ onyinye.
EXO 25:30 Dọkwasị achịcha nke iche nʼIhu nʼelu tebul ahụ, nʼihu m, oge niile.
EXO 25:31 “Jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Kpụọ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mee ka iko ya niile yiri okoko osisi, na isi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya.
EXO 25:32 Alaka isii ga-esite nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ.
EXO 25:33 Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile ga-adị nʼotu alaka, iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ.
EXO 25:34 Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, ọ ga-adị iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya.
EXO 25:35 Otu isi ga-adịkwa nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta. Isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ. Isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii.
EXO 25:36 Isi nwapụta ya na alaka ya niile ga-adịkọtakwa ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ.
EXO 25:37 “Ị ga-eme oriọna asaa, dọba ha nʼelu ihe ịdọkwasị iheọkụ ahụ, ka ha na-enye ìhè naanị nʼebe ihu ya.
EXO 25:38 Mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile, ga-abụ ọlaedo a nụchara anụcha.
EXO 25:39 Ọlaedo a nụchara anụcha nke dị iri kilogram atọ na anọ ka a ga-eji kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna ahụ na ngwongwo ndị a niile.
EXO 25:40 Lezie anya hụ na i mere ihe ndị a niile nʼusoro ihe atụ nke e gosiri gị nʼelu ugwu.
EXO 26:1 “Rụọ ụlọ nzute nke ga-enwe akwa mgbochi iri, nke e ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie kpaa akwa ndị a. Onye ọrụ aka na-eme ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha.
EXO 26:2 Akwa mgbochi ndị a ga-aha nʼotu. O nweghị nke ga-aka ibe ya. Ogologo akwa mgbochi ọbụla ga-abụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ya bụ otu mita na sentimita asatọ.
EXO 26:3 Dụkọtaa akwa mgbochi ise nʼotu, dụkọtaakwa ise nke ọzọ nʼotu.
EXO 26:4 Jiri akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka ị ga-emekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ.
EXO 26:5 Dụnye iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ. Mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu.
EXO 26:6 Ị ga-emekwa iri nko ọlaedo ise, nke ị ga-eji jikọta akwa mgbochi abụọ ahụ nʼotu, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ bụrụ otu.
EXO 26:7 “Ị ga-eji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ.
EXO 26:8 Akwa mgbochi iri na otu ndị a ga-aha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo. Ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ.
EXO 26:9 Dụkọtaa ise nʼime akwa mgbochi ahụ. Debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche. Pịajie akwa mgbochi nke isii ụzọ abụọ nʼihu ụlọ nzute ahụ.
EXO 26:10 Dụnyekwa iri anya nko ise nʼelu ọnụ otu akwa mgbochi ndị ahụ. Meekwa otu ihe ahụ nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ e debere iche.
EXO 26:11 Meekwa iri nko bronz ise, mee ka nko ahụ baa nʼanya nko nke ọzọ, i ji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu.
EXO 26:12 Ma banyere ogologo akwa mgbochi nke fọdụrụ maka ụlọ nzute, ya bụ ọkara akwa mgbochi nke mapụtara, nke a ga-akwụba nʼazụ ụlọ nzute ahụ.
EXO 26:13 Akwa mgbochi ahụ ga-eji ihe ruru ọkara mita nʼogologo karịa nʼakụkụ abụọ. Ụma ndị a mapụtara ga-akwụdata nʼakụkụ abụọ nke ụlọ nzute ahụ ikpuchi ya.
EXO 26:14 Ị ga-eji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ikpukwasị nʼelu ya.
EXO 26:15 “Ị ga-emere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.
EXO 26:16 Mbudo ibo ọbụla ga-adị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara.
EXO 26:17 Mbudo ibo ndị a ga-enwe ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ị ga-arụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.
EXO 26:18 Ị ga-arụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
EXO 26:19 Meekwa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ.
EXO 26:20 Nʼakụkụ nke ọzọ, bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ị ga-arụkwa iri mbudo ibo abụọ.
EXO 26:21 Rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
EXO 26:22 Nʼebe isi isi nsọtụ, ya bụ akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute, ị ga-arụ mbudo ibo isii.
EXO 26:23 Rụọ mbudo ibo abụọ, ga-adị na nkuku niile nke nsọtụ ụlọ nzute ahụ.
EXO 26:24 Nʼisi nkuku abụọ ndị a, ha ga-anọ iche iche site nʼokpuru ruo nʼelu ya, ma a ga-ejikọ ha ọnụ nʼime otu mgbaaka, ha abụọ ga-adị otu ahụ.
EXO 26:25 Ha niile ga-adị mbudo ibo asatọ na ụkwụ ọlaọcha dị iri na isii, ya bụ ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
EXO 26:26 “Jiri osisi akashia mee osisi ntụbichi, ise maka mbudo ibo ndị dị nʼotu akụkụ nke ụlọ nzute,
EXO 26:27 ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
EXO 26:28 Osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ga-esite nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ.
EXO 26:29 Jiri ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile, kpụọ mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta osisi ntụbichi ndị a. Jirikwa ọlaedo machie osisi ntụbichi ndị a.
EXO 26:30 “Guzobe ụlọ nzute a nʼusoro dịka ụdịdị ihe ahụ m ziri gị nʼelu ugwu si dị.
EXO 26:31 “Meekwa akwa mgbochi nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
EXO 26:32 Were anya nko ọlaedo kwụba ya nʼelu ogidi osisi akashia anọ nke e ji ọlaedo machie, mee ka o guzoro nʼelu ụkwụ ọlaọcha anọ.
EXO 26:33 Konye akwa mgbochi ahụ na nko ndị ahụ, ma dọnye igbe ihe ama ahụ nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Akwa mgbochi ahụ ga-ekewapụ Ebe Nsọ ahụ site nʼEbe Kachasị Nsọ.
EXO 26:34 Tinye ihe mkpuchi mmehie ahụ nʼelu igbe ihe ama nʼime Ebe Kachasị Nsọ.
EXO 26:35 Dọnye tebul ahụ na mpụta nke akwa mgbochi ahụ, nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ. Dọnyekwa ihe ịdọkwasị iheọkụ na ncherita ihu tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda.
EXO 26:36 “Ị ga-eme akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ nke eji ogho na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
EXO 26:37 Ị ga-arụrụ akwa mgbochi a anya nko ọlaedo na ogidi ise nke osisi akashia nke e ji ọlaedo machie. Ị ga-arụkwa ụkwụ bronz ise maka ha.
EXO 27:1 “Ị ga-eji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja. Ịdị elu ya ga-abụ otu mita na iri sentimita anọ. Ogologo ya na obosara ya ga-aha nʼotu, mita abụọ na iri sentimita atọ, mita abụọ na iri sentimita atọ.
EXO 27:2 Rụnye mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ bụrụ ihe e jikọtara nʼotu. Jiri bronz machie ebe ịchụ aja a.
EXO 27:3 Jiri bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ.
EXO 27:4 Ị ga-eme ngịga mbadamba, ihe ọkpụkpa bronz, meekwa mgbaaka bronz nke ga-adị nʼakụkụ anọ nke ngịga ahụ.
EXO 27:5 Tinye ya nʼokpuru oghere dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Tinye ya ka ọ dịrị nʼetiti ebe ịchụ aja ahụ.
EXO 27:6 Jiri osisi akashia mee mkpara osisi maka ebe ịchụ aja ahụ, were bronz machie ha.
EXO 27:7 A ga-eme ka mkpara ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ka ha dị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ mgbe ọbụla a na-ebu ya.
EXO 27:8 Jiri obodobo osisi rụọ ebe ịchụ aja ahụ, ka o nwee oghere nʼime, dịka igbe. Ị ga-arụ ya dịka e gosiri gị nʼelu ugwu ahụ.
EXO 27:9 “Ị ga-arụkwa ogige maka ụlọ nzute ahụ. Nʼakụkụ ndịda ya ga-adị iri mita anọ na ise nʼogologo. Ọ ga-enwekwa akwa mgbochi nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.
EXO 27:10 Iri ogidi abụọ ga-adị na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ. Anya nko ogidi ndị ahụ ha na ihe ikegide ha ga-abụ ọlaọcha.
EXO 27:11 Otu a kwa, akụkụ ugwu ga-adịkwa iri mita anọ na ise. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, nwekwa iri ogidi abụọ na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ, ya na anya nko nke ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.
EXO 27:12 “Akụkụ ọdịda anyanwụ nke ogige ahụ ga-adị iri mita abụọ na atọ nʼobosara. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, na ogidi iri na ebe ndọkwasị iri.
EXO 27:13 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe anwụ na-awalite, akwa mgbochi ahụ ga-adịkwa iri mita abụọ na atọ nʼobosara.
EXO 27:14 Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ ga-adị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.
EXO 27:15 Otu a kwa, akwa mgbochi nke ịdị ogologo ya dị mita asaa ga-adị nʼakụkụ nke ọzọ. Ọ ga-enwekwa ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.
EXO 27:16 “Banyere ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ, mee akwa mgbochi ga-adị mita itoolu nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, akaọrụ nke onye na-akpa ihe ịchọ mma. Ọ ga-enwe ogidi anọ na ihe ndọkwasị anọ.
EXO 27:17 Ogidi niile dị gburugburu ogige ahụ ga-enwe ihe njikọta ọlaọcha na nko, tinyere ebe ndọkwasị bronz.
EXO 27:18 Ogologo ogige ahụ ga-abụ iri mita anọ na ise. Ebe obosara ya ga-adị iri mita abụọ na atọ. Ọ ga-enwe akwa mgbochi nke ịdị elu ya dị iri mita abụọ na atọ, nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, nwekwa ebe ndọkwasị bronz.
EXO 27:19 Ngwongwo niile nke e ji eje ozi nʼụlọ nzute ahụ, ihe ọbụla bụ ọrụ ha, tinyere ǹtu ya niile na nke ogige ahụ, ga-abụ ihe e ji bronz rụọ.
EXO 27:20 “Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ nke a na-agwaghị ihe maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile.
EXO 27:21 Nʼime ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe Ihe Ama ahụ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eme ka oriọna ndị ahụ dị nʼihu Onyenwe anyị, na-enwu ọkụ, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nʼetiti ndị Izrel nye ọgbọ niile dị nʼihu.
EXO 28:1 “Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel kpọbata nwanne gị nwoke Erọn, ya na ụmụ ya ndị ikom, bụ Nadab, na Abihu, na Elieza na Itama. Ka ha jeere m ozi dịka ndị nchụaja.
EXO 28:2 Meere Erọn nwanne gị nwoke uwe nsọ, nke ga-enye ya ugwu na nsọpụrụ.
EXO 28:3 Gwa ndị niile nwere onyinye ǹka nʼịdụ akwa, bụ ndị m nyere amamihe nʼihe ndị a, sị ha dụọrọ Erọn uwe pụrụ iche, nke e ji edo ya nsọ, ime ya onye na-ejere m ozi dịka onye nchụaja.
EXO 28:4 Nke a bụ ụdị uwe ha ga-adụ: Ihe mgbochi obi, efọọd, uwe ime ahụ akpara akpa na-enweghị aka na uwe mwụda buru ibu, na uwe ime ahụ nke tụrụ agwa agwa na akwa a na-atụhị nʼisi na nke a na-eke nʼukwu. Ha ga-adụrụ Erọn nwanne gị nwoke na ụmụ ya ndị ikom uwe ndị a dị nsọ. Ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
EXO 28:5 Ka ha jiri ogho ọlaedo, nke na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha dụọ ha.
EXO 28:6 “Weere ogho ọlaedo, na nke na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee efọọd ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
EXO 28:7 Ọ ga-enwe akwa nʼubu ya abụọ nke e ji ejikọta ọnụ nkuku ya abụọ, ka e nwe ike na-ekechisi ya ike.
EXO 28:8 Ihe okike nke ukwu ahụ nke onye ǹka kpaziri nke ọma ga-adị ka ya. Ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.
EXO 28:9 “Were nkume ọniks abụọ, gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu ya,
EXO 28:10 nʼusoro dịka e si mụọ ha, isii nʼelu otu nkume, isii fọdụrụ na nkume nke ọzọ.
EXO 28:11 Gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu nkume abụọ ndị ahụ, dịka onye ǹka si egbunye akara na nkume. Mgbe ahụ, hịọnye nkume ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo ahụ a kpara akpa,
EXO 28:12 jikọta ha nʼelu akwa ubu nke efọọd ahụ ka ọ bụrụ nkume ncheta mgbe ebighị ebi nye ụmụ Izrel. Erọn ga-ebukwa aha ndị a nʼelu ubu ya abụọ, dịka ihe ncheta nʼihu Onyenwe anyị.
EXO 28:13 Ị ga-eji ọlaedo mee ihe ịchọ mma a tụrụ atụ.
EXO 28:14 Jirikwa ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ eriri a tụhịkọtara dịka ụdọ, jikọta eriri ọlaedo ahụ na ihe ịchọ mma ndị ahụ.
EXO 28:15 “Ị ga-adụ ihe mgbochi obi nke ikpe, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Mee ya dịka efọọd ahụ: jiri ogho edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee ya.
EXO 28:16 Akụkụ anọ ya ga-aha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara, nke apịajiri ụzọ abụọ.
EXO 28:17 Mgbe ahụ, hịọnye nʼelu ya ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa. Ụdị ga-adị nʼahịrị nke mbụ bụ, nkume kanelian, krisolaịt na beril,
EXO 28:18 nʼahịrị nke abụọ, ga-abụ nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.
EXO 28:19 Nʼahịrị nke atọ ga-abụ nkume jasint, ageeti na ametisiti.
EXO 28:20 Nʼahịrị nke anọ, ga-abụ nkume topaazi, ọniks na jaspa. Hịọnye ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa.
EXO 28:21 Ha niile ga-adị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.
EXO 28:22 “Jiri ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi.
EXO 28:23 Kpụkwaa mgbaaka ọlaedo abụọ, dụnye ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ.
EXO 28:24 Dụnye ụdọ ọlaedo abụọ ndị ahụ nʼelu mgbaaka ndị ahụ dị na nkuku ihe mgbochi obi ahụ,
EXO 28:25 were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa, konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya.
EXO 28:26 Ị ga-emekwa mgbaaka ọlaedo, konye ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ, nʼime ọnụ ọnụ ya ebe dị nso efọọd ahụ.
EXO 28:27 Ị ga-akpụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konye ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe nʼihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara ya, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ.
EXO 28:28 A ga-eji eriri na-acha anụnụ kekọta mgbaaka ihe mgbochi obi ahụ na mgbaaka efọọd ahụ, jikọtaa ya na ihe okike ukwu ahụ, ime ka ihe mgbochi obi ahụ ghara ịtọghapụ site nʼefọọd ahụ.
EXO 28:29 “Nʼụzọ dị otu a, mgbe ọbụla Erọn banyere nʼEbe Nsọ, ọ ga-ebu aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu obi ya, nʼelu ihe mgbochi obi nke ikpe ahụ, dịka ihe ncheta nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile.
EXO 28:30 Ị ga-etinyekwa nʼime ihe mgbochi obi ahụ ụmụ nkume abụọ e ji ajụta ase nke bụ Urim na Tumim. Ha ga-adị nʼelu obi Erọn mgbe ọbụla ọ gara nʼihu Onyenwe anyị. Otu a kwa, Erọn ga-ebukwa ihe e ji ajụta ase banyere ndị Izrel nʼelu obi ya mgbe niile, nʼihu Onyenwe anyị.
EXO 28:31 “Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ị ga-eji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ.
EXO 28:32 Ọ ga-enwe oghere nʼetiti ya ebe a ga-esi na-etinye isi. A ga-enwe ihe ọkpụkpa gburugburu oghere a dịka nke olu uwe agha, ime ka o sie ike, ghara ịdọka.
EXO 28:33 Nʼọnụ ala ala uwe ahụ gburugburu, ị ga-akpanye ihe ọkpụkpa oyiyi mkpụrụ pomegranet. Ọ bụ ogho nke na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie ka ị ga-eji. Ị ga-akpanyekwa ataṅụ ọlaedo nʼetiti ha.
EXO 28:34 Nʼọnụ ọnụ ala uwe mwụda ahụ, a ga-adụnye otu ataṅụ ọlaedo, otu oyiyi mkpụrụ pomegranet, gbaa gburugburu.
EXO 28:35 Mgbe ọbụla Erọn na-eje ozi ya, ọ ghaghị iyi ya. Aga na anụ mgbịrịgba ataṅụ ahụ ka ọ na-akụ, mgbe ọ banyere nʼEbe Nsọ ahụ nʼihu Onyenwe anyị, na mgbe o si nʼebe ahụ na-apụta, ka ọ ghara ịnwụ.
EXO 28:36 “Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee efere ntakịrị, gbunye akara dị otu a nʼelu ya: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
EXO 28:37 Kenye eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ; ọ ga-adị nʼihu akwa ike nʼisi ahụ.
EXO 28:38 Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn. Ọ ga-ebukwa ikpe ọmụma metụtara njehie gbasara ihe nsọ niile nke ụmụ Izrel doro nsọ, na onyinye ha niile. Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn mgbe niile, ka ha bụrụ ndị Onyenwe anyị ga-anabata.
EXO 28:39 “Jiri ezi akwa ọcha kpaa uwe ime ahụ. Werekwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi ahụ. Ihe ike nʼukwu ahụ ga-abụ ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma.
EXO 28:40 Meekwara ụmụ ndị ikom Erọn uwe ime ahụ, ihe ike nʼukwu na akwa ike nʼisi, inye ha ugwu na nsọpụrụ.
EXO 28:41 Mgbe i yinyekwasịrị Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị ikom uwe ndị a, tee ha mmanụ, doo ha nsọ. Chee ha nʼihu m ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
EXO 28:42 “Meekwara ha uwe ụkwụ nke eji akwa ọcha mee, maka ikpuchi anụ ahụ ha. Ọ ga-esite nʼukwu ruo nʼikpere.
EXO 28:43 Erọn na ụmụ ya ndị ikom aghaghị iyi ha mgbe niile ha ga-aba nʼime ụlọ nzute, maọbụ mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja ije ozi nʼEbe Nsọ. Ka ha ghara imeta ihe ikpe ọmụma, ma nwụọ. “Nke a ga-abụ iwu na ụkpụrụ ebighị ebi, nke ga-adịrị Erọn na ụmụ ụmụ ya.
EXO 29:1 “Nke a ga-abụ usoro mmemme nke ị ga-eme, iji doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ, ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Were nwa oke ehi na ebule abụọ nke na-enweghị ntụpọ ọbụla.
EXO 29:2 Werekwa ọka wiiti a kwọrọ nke ọma, mee achịcha nke na-enweghị ihe na-eko achịcha e tinyere nʼime ha, achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e ji mmanụ oliv gwakọtaa, ya na achịcha mbadamba ọzọ dị nta na-ekoghị eko nke e tere mmanụ nʼahụ ya.
EXO 29:3 Mgbe ahụ, ị ga-etinye achịcha ndị a niile nʼime otu nkata, bute ha nʼime nkata ahụ, wetakwa nwa oke ehi, na ebule abụọ.
EXO 29:4 Kpọpụta Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, jiri mmiri saa ha ahụ.
EXO 29:5 Yikwasị Erọn uwe ime ahụ, uwe mwụda nke efọọd, efọọd ahụ na ihe mgbochi obi. Were ihe okike efọọd ahụ nke akpaziri nke ọma kegide ya efọọd ahụ nʼahụ.
EXO 29:6 Tụhịakwa akwa ike nʼisi ahụ nʼisi ya. Tinye okpu nsọ ahụ nʼelu akwa ike nʼisi ahụ.
EXO 29:7 Werekwa mmanụ nsọ ahụ, tee ya, site nʼịwụkwasị ya nʼisi ya.
EXO 29:8 Kpọta ụmụ ya ndị ikom, yikwasị ha uwe ime ahụ.
EXO 29:9 Kekwasịkwa ha ihe okike nʼisi. Keekwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom ihe ike nʼukwu. Mgbe ahụ ọrụ ndị nchụaja ga-abụ nke ha site nʼụkpụrụ ebighị ebi. “Nʼụzọ dị otu a ka ị ga-esi doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ.
EXO 29:10 “Kpụta oke ehi ahụ nʼihu ụlọ nzute. Erọn na ụmụ ndị ikom ga-ebikwasị aka ha nʼelu isi ya.
EXO 29:11 Gbuo ya nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
EXO 29:12 Jiri mkpịsịaka gị rụta ụfọdụ nʼime ọbara oke ehi ahụ tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Wụpụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja.
EXO 29:13 Were abụba niile kpuchiri ihe ime ya, mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ ya na abụba dị nʼelu ha, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.
EXO 29:14 Ma anụ oke ehi ahụ, akpụkpọ ya na mgbịrị afọ ya, ka ị ga-akpọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ọ bụ aja mmehie.
EXO 29:15 “Were otu nʼime ebule ndị ahụ, ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya.
EXO 29:16 Gbuo ya. Werekwa ọbara ya fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja.
EXO 29:17 Bọwasịa ebule ahụ ntakịrị ntakịrị, sachaa eriri afọ ya na ihe dị ya nʼime, ha na ụkwụ ya niile, tinyekọ ha na isi ya na akụkụ anụ ndị ọzọ.
EXO 29:18 Kpọọ ebule ahụ niile ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke isisi ya dị ezi mma. Aja a chụrụ nye Onyenwe anyị site nʼọkụ.
EXO 29:19 “Were ebule nke ọzọ, ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-ebikwasị aka ha nʼelu isi ya.
EXO 29:20 Gbuo ya. Were ụfọdụ nʼime ọbara ya tee Erọn na ụmụ ya nʼọnụ ntị aka nri ha, na isi mkpụrụ aka nke aka nri ha, ya na isi mkpụrụ ụkwụ nke ụkwụ aka nri ha. Werekwa ọbara nke fọdụrụ fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
EXO 29:21 Ị ga-esite nʼelu ebe ịchụ aja were ụfọdụ ọbara, ya na ụfọdụ mmanụ nsọ, fesa ya nʼahụ Erọn na nʼelu uwe ya, nʼahụ ụmụ ya ndị ikom, nakwa nʼelu uwe ha niile. Mgbe ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom ga-abụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ha na uwe ha.
EXO 29:22 “Were abụba ebule ahụ, na akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba nke kpuchiri ime ya, mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba gbara ha gburugburu, na apata aka nri ya (nʼihi na ebule ahụ bụ ebule ido nsọ),
EXO 29:23 site na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke na-adị nʼihu Onyenwe anyị. Were otu achịcha dị gburugburu, otu ogbe achịcha a gwakọtara mmanụ oliv, na otu mbadamba ogbe achịcha,
EXO 29:24 tinye ihe ndị a niile nʼaka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, mee ka ha fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
EXO 29:25 Mgbe ahụ, nara ha site nʼaka ha. Kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ha na aja nsure ọkụ, ka ọ bụrụ ihe isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị. Onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
EXO 29:26 Mgbe i wepụtara obi ebule ahụ e ji doo Erọn nsọ, fufee ya nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ọ ga-abụkwa oke nke gị.
EXO 29:27 “Doo akụkụ ebule ido nsọ ahụ nsọ, ndị nke bụ oke Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ya bụ, obi ya e fufere efufe na apata ya e chere nʼihu Onyenwe anyị.
EXO 29:28 Nke a ga-abụ oke Erọn na ụmụ ụmụ ya ga-eketa dịka ụkpụrụ mgbe ebighị ebi nʼaka ndị Izrel. Mgbe niile ọbụla ha na-achụ aja udo maọbụ aja ekele, ka nke a bụrụ onyinye ụmụ Izrel na-enye Onyenwe anyị site nʼaja ha.
EXO 29:29 “Uwe nsọ Erọn ndị a niile ka a ga-edebe nʼihi mmemme ido nsọ. A ga-eji ha na-edo ụmụ ya nsọ bụ ndị ga-anọchi anya ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
EXO 29:30 Nwa ya nwoke ọbụla nke nọchiri anya ya dịka onye nchụaja, nke bịara nʼụlọ nzute m ije ozi nʼEbe Nsọ ga-eyi uwe ndị a ụbọchị asaa.
EXO 29:31 “Were anụ ebule ido nsọ ahụ, sienụ anụ ahụ nʼebe dị nsọ.
EXO 29:32 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri anụ ebule ahụ, na achịcha ndị ahụ dị nʼime nkata nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
EXO 29:33 Ha ga-eri ihe ndị aja niile ahụ nke e ji chụọ aja mkpuchi mmehie, nʼoge ido nsọ ha. Ọ dịghị onye ọbụla ọzọ ga-eso ha rie ya, nʼihi na ha bụ ihe dị nsọ.
EXO 29:34 Ọ bụrụ na ụfọdụ nʼime anụ na achịcha ido nsọ ndị ahụ afọdụ ruo ụtụtụ, a ga-akpọ ha ọkụ. A gaghị eri ya ọzọ, nʼihi na ọ bụ ihe dị nsọ.
EXO 29:35 “Ọ bụ otu a ka a ga-esi doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ, dịka ihe niile m nyere gị nʼiwu si dị. Ọ ga-ewe ụbọchị asaa iji doo ha nsọ.
EXO 29:36 Ị ga-achụ aja oke ehi dịka aja mmehie maka ikpuchi mmehie kwa ụbọchị. Ị ga-emekwa ka ebe ịchụ aja m dị ọcha, site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie nʼelu ya, na ite ya mmanụ nʼihi iji doo ya nsọ.
EXO 29:37 Ụbọchị asaa ka ị ga-edo ebe ịchụ aja nsọ site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie. Mgbe ahụ ebe ịchụ aja ga-abụ ebe dịkarịsịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ebe ịchụ aja ahụ ga-adị nsọ.
EXO 29:38 “Ma nke a bụ ihe ị ga-achụ nʼelu ebe ịchụ aja kwa ụbọchị, ị ga-eji ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ chụọ aja.
EXO 29:39 Chụọ otu nʼoge ụtụtụ; chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi.
EXO 29:40 Ị ga-ewere nwa atụrụ, tinyere lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri akwọzi nke a gwọkọtara nʼotu lita mmanụ oliv asụrụ asụ, chụọ aja. Wetakwa otu lita mmanya dịka aja ihe ọṅụṅụ.
EXO 29:41 Jirikwa nwa atụrụ nke ọzọ, ya na otu ụdị aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ ya dịka i mere nʼụtụtụ. Aja isisi ya dị ezi mma, nke e sitere nʼọkụ a na-achụ nye Onyenwe anyị.
EXO 29:42 “A ga na-achụ aja nsure ọkụ a oge niile nʼọgbọ niile, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute m ka a ga-achụ ya, nʼihu Onyenwe anyị. Nʼihi nʼebe ahụ ka m ga-ezute gị gwa gị okwu.
EXO 29:43 Nʼebe ahụ kwa ka m ga-ezute ndị Izrel niile. Nʼihi ya, aga m esite nʼịdị ebube m doo ebe ahụ nsọ.
EXO 29:44 “E, aga m edo ụlọ nzute ahụ nsọ, ya na ebe ịchụ aja, na Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
EXO 29:45 Mgbe ahụ, aga m ebi nʼetiti ụmụ Izrel, bụrụkwa Chineke ha.
EXO 29:46 Ha ga-amata na m bụ Onyenwe anyị Chineke ha. Onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha, ka m si otu a biri nʼetiti ha. Abụ m Onyenwe anyị Chineke ha.
EXO 30:1 “Jiri osisi akashia rụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
EXO 30:2 Akụkụ anọ ya ga-aha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya ga-adị iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya ga-adị iri sentimita itoolu. Mpi ya niile ga-esi na ya pụta.
EXO 30:3 Jiri ọlaedo a nụchara anụcha machie elu ya, akụkụ ya niile nakwa mpi ya niile. Ị ga-ejikwa ọlaedo kpụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu.
EXO 30:4 Kpụnye mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọbụla, ebe ga na-ejide mkpara e ji ebu ya.
EXO 30:5 Ị ga-eji osisi akashia mee mkpara, jiri ọlaedo machie ha.
EXO 30:6 Ị ga-adọba ebe ịchụ aja ahụ nʼihu akwa mgbochi nke kpuchiri igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihu oche ebere ahụ dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ, nʼebe m ga-ezute gị.
EXO 30:7 “Ụtụtụ niile, mgbe Erọn doziri oriọna, ọ ga-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.
EXO 30:8 Nʼanyasị kwa, mgbe ọ na-amụnye ọkụ nʼoriọna ahụ, ọ ga-esurekwa ihe nsure ọkụ. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke ga-adị nʼihu Onyenwe anyị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
EXO 30:9 Unu echekwala ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-adịghị nsọ nʼelu ya, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ihe oriri, unu awụpụla onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ya.
EXO 30:10 Otu ugbo nʼafọ Erọn ga-ekpuchi mmehie nʼelu mpi ya. Mmemme mkpuchi mmehie a nke a na-eme otu ugbo nʼafọ, aghaghị ịbụ nke e ji ọbara nke si nʼaja a chụrụ nʼihi mkpuchi mmehie, nʼihi ọgbọ niile nke na-abịa. A ga na-edo ebe ịchụ aja nsọ otu a. Nke a bụ ebe dịkarịsịrị nsọ nye Onyenwe anyị.”
EXO 30:11 Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
EXO 30:12 “Mgbe ọbụla a gụrụ mmadụ ọnụ, onye Izrel ọbụla ga-akwụ Onyenwe anyị ụgwọ o ji gbara mkpụrụobi ya. Nke a dị mkpa, ka ihe otiti ọbụla ghara ịbịakwasị ha mgbe ị ga-agụ ha ọnụ.
EXO 30:13 Ihe onye a gụrụ ọnụ ga-akwụ bụ ọkara shekel, dịka shekel nke ebe nsọ si dị. Ọkara shekel bụ iri gera abụọ. Ọkara shekel a bụ onyinye nye Onyenwe anyị.
EXO 30:14 Ndị kwesiri inye onyinye a bụ ndị niile gbara iri afọ abụọ gbagoo. Ọ bụ ndị a kwesiri inye Onyenwe anyị onyinye a.
EXO 30:15 Ndị ọgaranya agaghị enye karịa ọkara shekel. Otu a kwa ndị ogbenye agaghị enye ihe dị ntakịrị karịa ọkara shekel. Nʼihi na onyinye a bụ onyinye unu na-enye Onyenwe anyị maka ikpuchiri mkpụrụobi unu mmehie.
EXO 30:16 Nabata ego niile ndị a site nʼaka ụmụ Izrel, ma jiri ya jee ozi dị nʼụlọ nzute. Ihe onyinye a ga-eme bụ ịkpọtụ uche Onyenwe anyị nʼebe unu nọ nʼihi mkpuchi mmehie maka ndụ unu.”
EXO 30:17 Ọzọkwa, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
EXO 30:18 “Jiri bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya, maka ịsa ihe. Wụnye mmiri nʼime ya, dọsa ya nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja.
EXO 30:19 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga na-asa ụkwụ na aka ha site na ya.
EXO 30:20 Mgbe ọbụla ha na-aba nʼụlọ nzute ahụ, ha ga-eji mmiri saa onwe ka ha ghara ịnwụ. Ọzọkwa, mgbe ha na-abịaru nso nʼebe ịchụ aja, maka ije ozi iche onyinye nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ,
EXO 30:21 ha ga-asa aka ha na ụkwụ ha, ka ha ghara ịnwụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
EXO 30:22 Ọzọkwa, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
EXO 30:23 “Were eso osisi na-esi isi ụtọ ndị a dị iche iche: máá, nke ọtụtụ ya ruru kilo isii, na ihe ruru kilo sinamọn abụọ na ụma itoolu, na kilo kalamus atọ,
EXO 30:24 na kilo kashia isii, na lita anọ na ụma asatọ nke mmanụ oliv, dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ ahụ si dị.
EXO 30:25 Ị ga-eji ya mepụta mmanụ nsọ, nke dị nsọ, nke a gwakọtara nke ọma dịka nke onye na-eme mmanụ na-esi isi ụtọ mere. Ọ ga-abụ mmanụ otite dị nsọ.
EXO 30:26 Ị ga-ewere mmanụ ahụ tee ụlọ nzute ahụ niile na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ,
EXO 30:27 na tebul ahụ, na ngwongwo ya niile, na nʼihe ịdọsa oriọna, na nʼihe niile dị ya nʼahụ, na nʼebe ịdọsa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ,
EXO 30:28 na nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya niile, na nʼite ịsa ụkwụ na aka, na nʼebe a na-adọba ya.
EXO 30:29 Ị ga-edo ha nsọ, ka ha bụrụ ihe dịkarịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-adịkwa nsọ.
EXO 30:30 “Ị ga-eji mmanụ otite a tee Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Ha niile ga-adịkwa nsọ, bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
EXO 30:31 Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nke a bụ mmanụ nsọ m, nke dị nsọ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
EXO 30:32 Agaghị awụsa ya nʼahụ mmadụ. O nwekwaghị onye kwesiri imepụta mmanụ otite dị otu a. Ọ dị nsọ, unu kwesikwara ido ya nsọ.
EXO 30:33 A ga-esite nʼetiti ndị m wezuga onye ọbụla mere ụdị mmanụ isi ọma a, maọbụ tee ya onye na-abụghị onye nchụaja m.’ ”
EXO 30:34 Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Were ụda na-esi isi ụtọ, dịka eso osisi stakit, na ọnyịcha, na galbanọm, na ezigbo frankisens a na-agwaghị ihe, nke ọtụtụ ha niile ga-abụ otu ihe.
EXO 30:35 Mee ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, nke a gwakọtara nke ọma, bụ ọrụ onye na-eme mmanụ isi ụtọ. Tinyekwa ya nnu, ka ọ bụrụ ihe nsure ọkụ a nụchara anụcha, nke dịkwa nsọ.
EXO 30:36 Gwerie ụfọdụ nʼime ya ka ọ dịka uzuzu. Wụsa ya nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ nʼime ụlọ nzute, ebe m ga-ezute gị. Ọ ga-abụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye unu.
EXO 30:37 Unu emerela onwe unu nke dịka ọtụtụ ụdị ihe nsure ọkụ a. Hụta ya ka ihe dị nsọ nʼebe Onyenwe anyị nọ.
EXO 30:38 Onye ọbụla meere onwe ya ụdị ihe nsure ọkụ a, ịnụ isisi ya, a ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ụmụnna ya.”
EXO 31:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
EXO 31:2 “Lee, ahọpụtala m Bezalel nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda,
EXO 31:3 emejupụtakwala m ya na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta, ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche,
EXO 31:4 ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz,
EXO 31:5 ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi, na ịrụ ọrụ ǹka dị iche iche.
EXO 31:6 Ọzọkwa, ahọpụtala m Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, ka ọ bụrụ onye inyeaka Bezalel. “Enyekwala m ndị ǹka niile amara ịrụ ọrụ dị iche, nke ga-enyere ha aka ịrụ ihe ndị a niile m nyere gị iwu ịrụ:
EXO 31:7 “ya bụ, ụlọ nzute ahụ, na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, na ebe mkpuchi mmehie dị ya nʼelu, na ngwongwo ndị ọzọ niile dị nʼụlọ ikwu ahụ,
EXO 31:8 na tebul, na ngwongwo ya, ma ihe ịdọkwasị oriọna nke ọlaedo a nụchara anụcha, na ngwongwo ya,
EXO 31:9 na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya, na ite mmiri ịsa ụkwụ na aka, na ụkwụ ite ahụ.
EXO 31:10 Na uwe ọma ahụ akpara akpa, ma uwe nsọ Erọn onye nchụaja na uwe nke ụmụ ya ndị ikom, mgbe ha na-eje ozi dịka ndị nchụaja.
EXO 31:11 Ya na mmanụ nsọ ahụ, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ e mere maka Ebe Nsọ. “Ha ga-arụzu ihe ndị a nʼusoro dịka m si nye gị ya nʼiwu.”
EXO 31:12 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis,
EXO 31:13 Gwa ndị Izrel, “Unu aghaghị ido ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi na nke a ga-abụ ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu ruo ọgbọ niile ga-abịa, ka unu maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-edo unu nsọ.
EXO 31:14 “ ‘Ụbọchị izuike m dị nsọ nye unu. Nʼihi nke a, unu ga-edebe ya nsọ. Ọ bụrụ na onye ọbụla edebeghị ya nsọ, ọ ga-anwụ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla arụọ ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike m, a ga-ewezuga ya site nʼebe unu nọ.
EXO 31:15 Ụbọchị isii ka unu ga-arụ ọrụ unu niile. Ma ụbọchị nke asaa dị iche. Ọ bụ ụbọchị izuike. Ọ bụkwa ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, onye ọbụla rụrụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị Izuike ga-anwụ.
EXO 31:16 Ndị Izrel ga-edebe ụbọchị Izuike, na-eme mmemme ya nʼọgbọ niile, dịka ọgbụgba ndụ nke ebighị ebi.
EXO 31:17 Ọ ga-abụ ihe ịrịbama nke ga-adịgide nʼetiti mụ na ndị Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na nʼụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa. Ọ kwụsịrị ọrụ nʼụbọchị nke asaa, zuo ike, turu ndụ.’ ”
EXO 31:18 Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Mosis okwu ndị a nʼelu ugwu Saịnaị, o nyere ya mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Ọ bụkwa mbadamba nkume ndị ahụ nke mkpịsịaka Chineke dere ihe nʼelu ha.
EXO 32:1 Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ na Mosis anọọla ọdụ ịrịdata site nʼelu ugwu Saịnaị, ha zukọtara, bịakwute Erọn, sị ya, “Bilie, meere anyị chi ndị ga-edu anyị, nʼihi na nwoke a bụ Mosis onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt, anyị amaghị ihe mere ya.”
EXO 32:2 Erọn zara sị ha, “Yipụtanụ ọlantị ọlaedo ndị nwunye unu, na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom yi. Wetara m ha.”
EXO 32:3 Ngwangwa, ha niile yipụrụ ọlantị ha weta ha nye Erọn.
EXO 32:4 Ọ naara ya nʼaka ha, were ngwa ọrụ e ji egbunye akara, kpụtara ha arụsị nwa oke ehi. Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke sitere nʼala Ijipt dupụta unu.”
EXO 32:5 Mgbe Erọn hụrụ na ụmụ Izrel jupụtara nʼobi aṅụrị, nʼihi ihe ahụ ọ kpụrụ, o wuru ebe ịchụ aja nʼihu nwa ehi ahụ ọ kpụrụ, kwuo okwu sị, “Echi, a ga-enwe oke mmemme nye Onyenwe anyị!”
EXO 32:6 Ya mere na echi ya, ha biliri nʼoge, bido ịchụ aja nsure ọkụ, na aja udo, nye nwa ehi ahụ a kpụrụ akpụ. Mgbe nke a gasịrị, ha nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.
EXO 32:7 Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Gbada ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i dupụtara site nʼIjipt emerụọla onwe ha.
EXO 32:8 Nʼotu ntabi anya a, ha ahapụla ụzọ m niile. Ha akpụọlara onwe ha arụsị nwa oke ehi, nke ha na-efe ofufe, nke ha chụkwaara aja nye. Ha kwukwara sị, ‘Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke dupụtara unu site nʼala Ijipt.’ ”
EXO 32:9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike, na ndị na-enupu isi.
EXO 32:10 Ugbu a, hapụ m ka iwe m bịakwasị ha, ka m laa ha nʼiyi. Aga m eme ka gị onwe gị bụ Mosis bụrụ mba ukwu nʼọnọdụ ha.”
EXO 32:11 Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị Chineke ya arịrịọ sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gịnị mere iwe gị ji dị ọkụ otu a nʼebe ndị gị nọ bụ ndị nke i ji ike ebube gị, na ọtụtụ ihe ịrịbama dị ịtụnanya, dupụta site nʼala Ijipt?
EXO 32:12 Nʼihi gịnị ka ndị Ijipt ga-ekwu sị, ‘Ọ bụghị ime ha ihe ọjọọ ka o ji dupụta ha, ka o nwee ike gbuo ha nʼugwu ndị a, ma kpochapụkwa ha site nʼelu ụwa a?’ Site nʼiwe gị dị ọkụ chigharịa, kwere ka ọ dajụọ. Chigharịakwaa site nʼatụmatụ ọjọọ a nʼebe ndị gị nọ.
EXO 32:13 Cheta nkwa ahụ i kwere ndị ohu gị bụ Ebraham, Aịzik, na Izrel. Nʼihi na i ji onwe gị ṅụọ iyi nye ha sị, ‘Aga m eme ka mkpụrụ gị mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe. Aga m enye ha ala m kwere ụmụ ụmụ gị na nkwa ka ọ bụrụ ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’ ”
EXO 32:14 Ya mere, Onyenwe anyị gbanwere obi ya. Ọ lakwaghị ha nʼiyi.
EXO 32:15 Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị site nʼugwu ahụ rịdata, mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ dị ya nʼaka. E dere ha ihe nʼihu abụọ, nʼihu nakwa nʼazụ.
EXO 32:16 Mbadamba nkume ndị ahụ bụ akaọrụ Chineke, ihe e dere nʼelu ha bụ ihe Chineke nʼonwe ya dekwasịrị nʼelu mbadamba nkume ndị ahụ.
EXO 32:17 Mgbe Joshua nụrụ ụzụ si na ndịda ugwu ahụ, nke ụmụ Izrel niile na-eme, ọ gwara Mosis okwu sị, “Ụzụ agha dị nʼọmụma ụlọ ikwu.”
EXO 32:18 Ma Mosis zara sị, “Mba, nke a abụghị ụzụ ndị meriri nʼagha, maọbụ ụzụ ndị e meriri nʼagha, kama ọ bụ olu abụ ka m na-anụ.”
EXO 32:19 Mgbe Mosis bịaruru nso ebe ahụ ha mara ụlọ ikwu ha, hụ nwa oke ehi ahụ a kpụrụ akpụ na egwu a na-ete, iwe were ya nke ukwuu. Ọ tụpụrụ mbadamba nkume ndị ahụ o ji nʼaka. Kụrie ha na ndịda ugwu ahụ.
EXO 32:20 Mosis weere nwa oke ehi ahụ ha kpụrụ akpụ, kpọọ ya ọkụ. Mgbe ahụ, o gweriri ya dịka ntụ. Fesaa ya nʼelu mmiri mee ka ụmụ Izrel ṅụọ mmiri ahụ.
EXO 32:21 Ọ gwara Erọn okwu sị, “Gịnị ka ndị a mere gị i ji bute ụdị mmehie ọjọọ dị otu a tụkwasị ha nʼisi?”
EXO 32:22 “Erọn zara sị ya, ka iwe gị ghara ịdị ọkụ, onyenwe m. Gị onwe gị maara ndị a, mata otu ha si bụrụ ndị ọjọọ.
EXO 32:23 Ha sịrị m, ‘Meere anyị chi ndị ga-edu anyị, nʼihi na nwoke a bụ Mosis onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt, anyị amaghị ihe mere ya.’
EXO 32:24 Asịrị m ha, ‘Onye ọbụla nke nwere ihe ịchọ ọma ọlaedo, ya yipu ya.’ Mgbe ahụ, ha wetara m ọlaedo ndị a, nke m tụbara nʼime ọkụ. Ihe si na ya pụta bụ nwa ehi a kpụrụ akpụ!”
EXO 32:25 Mosis hụrụ na omume ndị a jọgbuziri onwe ya na njọ nʼihi na Erọn mere ka isi kopu ha. Nke mere ka ha bụrụzia ihe ọchị nʼebe ndị iro ha dị.
EXO 32:26 O guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ahụ kwuo sị, “Onye ọbụla dịnyeere Onyenwe anyị ya bịakwute m.” Ndị Livayị niile bịakwutere ya.
EXO 32:27 Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nwoke ọbụla nyara mma agha ya nʼakụkụ ya, jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel, site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ. Ya gbuo ọbụladị nwanne ya nwoke, maọbụ enyi ya, maọbụ onye agbataobi ya.’ ”
EXO 32:28 Ndị Livayị mezuru ihe Mosis gwara ha. Ya mere ndị nwụrụ nʼụbọchị ahụ dị puku mmadụ atọ.
EXO 32:29 Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Livayị okwu sị, “Taa, unu ekewapụtala onwe unu nye Onyenwe anyị. Nʼihi na unu gburu ụmụ unu ndị ikom na ụmụnne unu ndị ikom. Ugbu a, ọ gọziela unu taa.”
EXO 32:30 Nʼechi ya, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị ha, “Unu emeela mmehie dị ukwuu megide Onyenwe anyị. Ma aga m alaghachikwuru Onyenwe anyị nʼelu ugwu ahụ rịọọ ya. Ma eleghị anya, aga m arịọta maka ikpuchi mmehie unu.”
EXO 32:31 Ya mere, Mosis jekwuuru Onyenwe anyị sị ya, “Biko Onyenwe anyị, ndị a emeela mmehie dị ukwuu megide gị, nʼihi na ha akpụọlara onwe ha chi ọlaedo.
EXO 32:32 Ma ugbu a, biko, gbaghara mmehie ha. Ọ bụrụ na ị gaghị agbaghara ha, biko hichapụ aha m site nʼakwụkwọ ahụ i dere.”
EXO 32:33 Ma Onyenwe anyị zara sị Mosis, “Onye ọbụla mehiere megide m ka a ga-ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ m.
EXO 32:34 Ma ugbu a, duru ndị a gaa ebe ahụ m gwara gị. Mmụọ ozi m ga-edu unu nʼije a. Ma otu ọ dị, mgbe m bịara ileta ndị a, aga m ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”
EXO 32:35 Ya mere, Onyenwe anyị mere ka ọrịa dị egwu bịakwasị ha, nʼihi ihe ha ji nwa ehi ahụ, bụ nke Erọn kpụrụ mee.
EXO 33:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Duru ndị a i si nʼala Ijipt kpọpụta baa nʼala ahụ m kwere Ebraham, na Aịzik na Jekọb na nkwa, nʼihi na agwara m ha sị, ‘Aga m enye ụmụ ụmụ unu ala a, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.’
EXO 33:2 Aga m ezipu Mmụọ ozi m ka ọ gaa nʼihu unu chụpụrụ unu ndị Kenan, na ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus.
EXO 33:3 Gbago nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ma agaghị m eso unu nʼije unu, nʼihi na unu bụ ndị isiike. Ọ bụrụ na m esoro unu, unu ga-anwa m ọnwụnwa, nke ga-eme ka m laa unu nʼiyi nʼụzọ.”
EXO 33:4 Mgbe ndị mmadụ ahụ nụrụ okwu olu ike ndị a, ha malitere iru ụjụ, ọ dịghịkwa onye ọbụla yinyere ihe ịchọ mma ya nʼahụ ha.
EXO 33:5 Nʼihi na Onyenwe anyị agwala Mosis sị, “Gwa ụmụ Izrel, ‘Unu bụ ndị isiike. A sị na m nọ nʼetiti unu, otu ntabi anya ezuorola m ịla unu nʼiyi. Ugbu a, yipụnụ ihe ịchọ mma niile unu yi nʼahụ, aga m ekpebi ihe m ga-eme unu.’ ”
EXO 33:6 Ya mere, ndị Izrel yipụrụ ihe ịchọ mma ha niile. Nʼugwu Horeb ka ha nọ mgbe ihe ndị a mere.
EXO 33:7 Nʼoge a, Mosis na-ewere ụlọ ikwu manye nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ọ na-akpọ ya ụlọ nzute. Ọ na-amanye ya nʼebe dị anya site nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Onye ọ bụla nke chọrọ ịjụta Onyenwe anyị ase, na-apụ, gaa nʼụlọ nzute ahụ nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
EXO 33:8 Mgbe ọbụla Mosis na-aga nʼụlọ ikwu nzute ahụ, ndị Izrel niile na-apụta guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ha, na-ele ya anya tutu Mosis abanye nʼụlọ ikwu ahụ.
EXO 33:9 Mgbe ọ banyere nʼụlọ ikwu ahụ; ogidi igwe ojii ahụ na-abịa guzochie nʼọnụ ụzọ mgbe Onyenwe anyị na Mosis na-akparị ụka.
EXO 33:10 Nʼoge ọbụla, ndị mmadụ hụrụ ogidi igwe ojii ahụ ka o guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu nzute ahụ, ha onwe ha na-eguzokwa, onye ọbụla, nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, kpọọ isiala.
EXO 33:11 Nʼime ụlọ nzute ahụ, Onyenwe anyị na-agwa Mosis okwu ihu na ihu, dịka mmadụ sị agwa enyi ya okwu. Mgbe ha kparịchara ụka, Mosis na-alọghachi azụ nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Ma nwokorobịa ahụ na-enyere ya aka, bụ Joshua, nwa Nun, na-anọgide nʼụlọ ikwu nzute ahụ.
EXO 33:12 Mgbe Mosis na Onyenwe anyị nọ na-ekwurịta okwu, ihe Mosis gwara ya bụ nke a, “Ọ dịla anya kemgbe ị na-agwa m sị m, ‘Duru ndị m baa nʼala ahụ e kwere na nkwa inye ha.’ Ma matakwa na ị gwabeghị m onye ị ga-edunyere m ga-eduzi m ụzọ. I kwuola na ị maara aha m, kwukwaa na achọtala m ihuọma nʼebe ị nọ.
EXO 33:13 Biko, ọ bụrụ na o si otu a dị, zi m ụzọ gị, nke ga-eme ka m mata gị, gaakwa nʼihu inweta ihuọma site nʼebe ị nọ. Chetakwa na mba a dị ukwu bụ ndị gị.”
EXO 33:14 Ọ zara sị, “Mụ onwe m ga-eso gị gaa, aga m enyekwa gị izuike.”
EXO 33:15 Mgbe ahụ Mosis sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị gaghị eso anyị nʼije a, ekwela ka anyị si nʼebe a zọpụ ụkwụ.
EXO 33:16 Ọ bụrụ na i soghị anyị, olee otu a ga-esi mata na mụ onwe m, na ndị gị achọtala ihuọma gị? Olee otu ọ ga-esi pụta ìhè na mụ na ndị gị bụ mba dị iche site na mba ndị ọzọ dị nʼụwa?”
EXO 33:17 Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị, “E, aga m eme ihe ị rịọrọ m, nʼihi na ị chọtala ihuọma m. Nʼezie, amara m onye ị bụ, marakwa aha gị.”
EXO 33:18 Mgbe ahụ, Mosis rịọrọ sị, “Gosi m ebube gị.”
EXO 33:19 Ma Onyenwe anyị zara sị, “Aga m eme ka ị hụ ịdị mma m, aga m akọwakwara gị ihe aha m bụ Onyenwe anyị pụtara. Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.
EXO 33:20 Ma ị pụghị ịhụ ihu m nʼihi na mmadụ ọbụla enweghị ike ịhụ ihu m ma dịrịkwa ndụ.”
EXO 33:21 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Lee, e nwere ebe dị nso nʼakụkụ m, nʼelu nkume, ebe i nwere ike iguzo.
EXO 33:22 Mgbe ebube m ga-agafe, aga m ezo gị nʼokpuru nkume, werekwa aka m kpuchie gị, tutu ruo mgbe m gafechara.
EXO 33:23 Emesịa, aga m eweli aka m, ka i nwee ike ịhụ azụ m anya, ma ị pụghị ịhụ ihu m.”
EXO 34:1 Onyenwe anyị gwara Mosis, “Wapụta mbadamba nkume abụọ dịka nke mbụ, aga m edekwasị nʼelu ha okwu niile nke dị nʼelu mbadamba nkume ndị mbụ ahụ, bụ nke ị tụpịasịrị.
EXO 34:2 Jikere nʼụtụtụ, rigoro ugwu Saịnaị ka i chee onwe gị nʼihu m nʼelu ugwu ahụ.
EXO 34:3 Onye ọbụla esokwala gị, ma ọ bụkwanụ nọdụ nso ugwu ahụ. Ekwekwala ka igwe ehi maọbụ igwe atụrụ kpaa nri nso nso ugwu ahụ.”
EXO 34:4 Mosis biliri nʼisi ụtụtụ, waa mbadamba nkume abụọ dịka ndị nke mbụ, rigoro ugwu Saịnaị dịka Onyenwe anyị gwara ya. Ọ jikwa nkume abụọ ahụ nʼaka ya.
EXO 34:5 Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime ogidi igwe ojii, guzo nʼihu Mosis, kwupụta aha ya bụ Onyenwe anyị.
EXO 34:6 O si nʼihu Mosis gafee na-ekwu na-asị, “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Chineke ọmịiko na onye amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, na onye babigara ụba oke nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
EXO 34:7 Onye na-egosi ịhụnanya ya nye imerime puku, ma na-agbaghara ajọ omume na nnupu isi, na mmehie. Ma ọ dịghị ahapụ ka onye ikpe mara laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ha ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.”
EXO 34:8 Otu mgbe ahụ, Mosis hulatara kpọọ isiala,
EXO 34:9 sị ya, “Ọ bụrụ nʼezie na m achọtala ihuọma nʼanya gị, Onyenwe m, ka Onyenwe m, biko soro anyị gaa. Ọ bụ ezie na ndị a bụ ndị isiike, gbaghara anyị ajọ omume anyị, na mmehie anyị niile, ka ị nabatakwa anyị dịka ndị nke gị.”
EXO 34:10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mụ onwe m na gị na-agba ndụ. Nʼihu ndị gị niile, aga m arụ oke ọrụ ịtụnanya dị ukwu, ụdị nke a na-emetụbeghị mbụ nʼụwa, maọbụ na mba ọ bụla. Ndị niile unu bi nʼetiti ha ga-ahụ ọrụ Onyenwe anyị. Ọrụ ahụ dị oke egwu nke m ga-arụ nʼihi unu.
EXO 34:11 Debe ihe niile m nyere gị nʼiwu taa. Aga m esite nʼihu unu chụpụ ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus.
EXO 34:12 Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ unu na-aba nʼime ya ghara ịgba ndụ. Ka ha ghara ị bụ ihe ịma nʼọnya nʼetiti unu.
EXO 34:13 Kama, tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha jiri mere chi ha.
EXO 34:14 Unu efela chi ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị, onye aha ya bụ Ekworo, bụ Chineke na-ekwo ekworo.
EXO 34:15 “Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ ghara ịgba ndụ, nʼihi na mgbe ha na-akwaso chi ha iko, na-achụkwa aja nye chi ha, ha ga-akpọ unu oku nri, mgbe ahụ, unu ga-eri site nʼihe aja ha.
EXO 34:16 Mgbe unu lụtara ụfọdụ ndị inyom ha dịka nwunye nye ụmụ unu ndị ikom, ndị inyom ndị a na-akwaso chi ha iko, ga-eme ka ụmụ unu ndị ikom soro ha nʼomume dị otu a.
EXO 34:17 “Unu akpụla chi ọbụla.
EXO 34:18 “Na-emenụ mmemme achịcha na-ekoghị eko. Rienụ achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa, dịka m nyere nʼiwu na a ga-eme nʼụbọchị ndị ahụ a họpụtara, nʼọnwa Abib, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta.
EXO 34:19 “Nwa nwoke ọbụla e bụ ụzọ mụọ bụ nke m, tinyere ụmụ anụ ụlọ, ma ehi, ma atụrụ, ma ewu.
EXO 34:20 E nwere ike ịgbapụta nwa oke ịnyịnya ibu site nʼiwere nwa atụrụ dochie nʼọnọdụ ya. Ọ bụrụ na i kpebie na ị gaghị agbapụta ya, mgbe ahụ, ị ga-agbaji olu ya. Ma ụmụ unu ndị ikom niile ka a ga-agbapụta. “O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abịa guzo m nʼihu na-ejighị onyinye.
EXO 34:21 “Nʼoge ịkụ ihe nʼubi na nʼoge owuwe ihe ubi, rụọnụ ọrụ naanị ụbọchị isii. Zukwanụ ike nʼụbọchị nke asaa.
EXO 34:22 “Mee Mmemme Izu Ụka asaa, bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ọka wiiti mee, na Mmemme Nchịkọta Ihe nʼọgwụgwụ afọ ọbụla.
EXO 34:23 Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nke Izrel.
EXO 34:24 Nʼihi na aga m esite nʼihu unu chụpụ mba dị iche iche. Meekwa ka ala unu saa mbara. Ọ dịghị onye ọbụla ga-enwe anya ukwu nʼebe ala unu dị, mgbe unu na-aga iche onwe unu nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ugbo atọ nʼafọ.
EXO 34:25 “Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nye m. Unu ahapụkwala aja sitere na Mmemme Ngabiga ka ọ nọọ ruo ụtụtụ.
EXO 34:26 “Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma nʼụlọ Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.”
EXO 34:27 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Dee iwu ndị a m nyere gị, nʼihi na dịka okwu ndị a si dị, ka ọgbụgba ndụ mụ na gị na ụmụ Izrel gbara si dị.”
EXO 34:28 Mosis na Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Ma nʼoge ndị a niile o righị nri ọbụla. Ọ ṅụkwaghị ihe ọṅụṅụ ọbụla. O dere na mbadamba nkume abụọ ahụ okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ, nke bụ iwu iri ahụ.
EXO 34:29 Mgbe Mosis ji mbadamba nkume abụọ nke ihe ama ahụ na-arịdata site nʼelu ugwu ahụ, ọ mataghị na ihu ya na-egbuke egbuke, nʼihi ọnọdụ nke ọ nọrọ nʼihu Onyenwe anyị.
EXO 34:30 Nʼihi mgbuke ahụ ihu Mosis na-egbuke, ụjọ ekweghị Erọn na ụmụ Izrel bịaruo ya nso.
EXO 34:31 Ma Mosis kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Nʼihi ya, Erọn na ndị ndu nzukọ Izrel bịara ka ha na Mosis kparịtaa ụka.
EXO 34:32 Mgbe e mesịrị, ndị Izrel niile bịakwutere ya. O nyekwara ha iwu ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ya nʼelu ugwu Saịnaị.
EXO 34:33 Mgbe Mosis gwachara ha okwu, o weere akwa kpuchie ihu ya.
EXO 34:34 Ma mgbe ọbụla ọ na-abanye nʼihu Onyenwe anyị ka ha kparịtaa ụka nʼime ụlọ nzute ahụ, ọ na-ekepụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya tutu ruo mgbe ọ nọchara pụta. Mgbe ọ pụtara, ọ na-agwa ndị Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
EXO 34:35 Ha hụkwara na ihu ya na akpụkpọ ihu ya na-egbuke egbuke. Emesịa, Mosis na-ekpuchikwa ihu ya tutu ruo mgbe ọ ga-abanye nʼime ka ya na Onyenwe anyị kparịta ụka.
EXO 35:1 Emesịa, Mosis kpọrọ nzukọ ụmụ Izrel niile gwa ha sị, “Ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere nke unu na-aghaghị idebe.
EXO 35:2 Rụọnụ ọrụ ụbọchị isii, ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike, ụbọchị dị nsọ nke izuike nye Onyenwe anyị. Onye ọbụla rụrụ ọrụ nʼụbọchị nke asaa ga-anwụ.
EXO 35:3 Unu amụnyela ọkụ nʼebe obibi unu nʼụbọchị izuike ahụ.”
EXO 35:4 Mgbe ahụ Mosis gwara nzukọ Izrel niile sị, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere,
EXO 35:5 sitenụ nʼihe unu nwere wetara Onyenwe anyị onyinye. Onye ọbụla nke ọ masịrị, ya wetara Onyenwe anyị onyinye nke ihe ndị a: “Ọlaọcha, ọlaedo na bronz,
EXO 35:6 ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, na ajị ewu;
EXO 35:7 akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri, na osisi akashia;
EXO 35:8 mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, ụda a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;
EXO 35:9 nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi.
EXO 35:10 “Unu niile ndị nwere onyinye ịkwa ǹka, bịanụ rụọ ihe ahụ niile Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu ịrụ, nke bụ ihe ndị a:
EXO 35:11 “ụlọ nzute ahụ, na ihe mkpuchi ya, na nko ya niile, na mbudo ibo ya, na mkpọrọ osisi ya, na ogidi ya, na ụkwụ ya niile.
EXO 35:12 Rụkwanụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na mkpara ahụ e ji ebu ya. Ya na oche ebere ahụ. Mekwaanụ akwa mgbochi nke ga-ekpuchi ebe nsọ ahụ,
EXO 35:13 na tebul ahụ, na mkpara e ji ebu ya, na ngwongwo ya niile, na achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị.
EXO 35:14 Mekwaa ebe ịdọkwasị oriọna maka ìhè, ya na ngwongwo ya niile, iheọkụ na mmanụ maka ịmụ ọkụ;
EXO 35:15 nʼebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na mkpara ya. Mmanụ nsọ ahụ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke e ji ụda mee; akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ nke dị nʼebe mbata ụlọ nzute ahụ;
EXO 35:16 ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ya na ihe ọkpụkpa bronz ya, mkpara e ji ebu ya na ngwongwo ya niile, efere ukwu ahụ na ihe ndọkwasị ya.
EXO 35:17 Akwa mgbochi nke ogige ụlọ ahụ na ogidi ha, na ihe ndọkwasị ya, nakwa akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ e si abanye nʼogige ahụ;
EXO 35:18 ǹtu maka ịkpọgide ụlọ ikwu ahụ na nke ogige ahụ, na ụdọ ha,
EXO 35:19 uwe niile a kpara akpa nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja.”
EXO 35:20 Ugbu a, ọgbakọ ụmụ Izrel niile siri nʼihu Mosis pụọ.
EXO 35:21 Onye ọbụla chọrọnụ na onye nke mmụọ ya kwaliri laghachiri azụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye nʼihi ọrụ nke ụlọ nzute ahụ na nʼihi ije ozi dị nʼime ya na nʼihi uwe nsọ ndị ahụ.
EXO 35:22 Ndị niile ọ metụrụ nʼobi, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị bịara weta onyinye ha. Ha wetaara Onyenwe anyị onyinye ihe ịchọ mma nke ọlaedo dị iche iche: ihe ịkpọchi uwe, ọlantị, ọlaaka na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma dị iche iche, nke e ji ọlaedo kpụọ. Ha chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
EXO 35:23 Ụfọdụ mmadụ wetara akwa na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie na nke uhie uhie maọbụ ezi akwa ọcha maọbụ akpụkpọ ajị ewu, akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara na akpụkpọ ehi mmiri.
EXO 35:24 Ndị ọzọ wetara ọlaọcha na bronz, dịka onyinye ha nyere Onyenwe anyị, ụfọdụ wetara osisi akashia nke a ga-eji wuo ụlọ ikwu ahụ.
EXO 35:25 Ụmụ nwanyị ndị bụ ọka nʼịdụ akwa na ikwe akwa tụrụ eri na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, webata ha dịka onyinye.
EXO 35:26 Ụfọdụ ụmụ nwanyị kwa ji onyinye ǹka pụrụ iche ha nwere kpaa ajị ewu dịka akwa pụrụ iche.
EXO 35:27 Ndị ndu niile wetakwara nkume ọniks na nkume ndị ọzọ nke ịhịọnye nʼihe a ga-eji dụọ efọọd na ihe mgbochi obi ahụ.
EXO 35:28 Ha wetakwara ụda dị iche iche, mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, nke a ga-eji mee mmanụ otite dị nsọ, mekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
EXO 35:29 Nʼụzọ dị otu a ka ụmụ Izrel niile, ma nwoke ma nwanyị, ndị chọrọ inyeaka nʼọrụ ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu si weta onyinye ha. Onye ọbụla nʼime ha nyere Onyenwe anyị onyinye afọ ofufu.
EXO 35:30 Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Izrel, sị, “Lee, Onyenwe anyị ahọpụtala Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda.
EXO 35:31 O mejupụtala na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta na ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche.
EXO 35:32 Ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz,
EXO 35:33 ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi nakwa ọrụ ǹka niile dị iche iche.
EXO 35:34 Ma o tinyela nʼime ya na Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, amara ikuziri ndị ọzọ ihe.
EXO 35:35 O mejupụtala ha nʼike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche, dịka igbunye akara, ise ihe osise, ịkpanye ihe ịchọ mma nʼakwa dị iche iche, ya bụ iji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa nʼezi akwa ọcha na nke ndị ọkpa akwa. Ha niile bụkwa ndị ǹka na ndị nchepụta ihe ịchọ mma doro anya.”
EXO 36:1 Ya mere, Bezalel na Oholiab na ndị ǹka niile Onyenwe anyị nyere ike na nghọta ịmata otu ha ga-esi rụọ ọrụ iwu ebe nsọ ahụ ga-arụ ọrụ ahụ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
EXO 36:2 Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Bezalel na Oholiab na ndị ǹka ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ike na nghọta, ndị wepụtara obi ha ịbịa ịrụ ọrụ ahụ.
EXO 36:3 Ha si nʼaka Mosis nara onyinye ndị ahụ niile ụmụ Izrel wetara maka ịrụ ọrụ ebe nsọ ahụ. Ndị mmadụ nọkwa na-eweta onyinye afọ ofufu ha ụtụtụ niile.
EXO 36:4 Nʼihi ya, ndị ọrụ ǹka niile nọ na-arụ ọrụ nʼebe nsọ ahụ hapụrụ ọrụ ha na-arụ,
EXO 36:5 bịakwute Mosis, sị ya, “Lee, onyinye ndị mmadụ na-eweta adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ịrụ ọrụ a Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
EXO 36:6 Mgbe ahụ, Mosis nyere iwu, ha zisara ozi ahụ nʼọmụma ụlọ ikwu niile sị, “Ka nwoke maọbụ nwanyị ọbụla gharakwa inwe ihe ọbụla nke ọ ga-eweta dịka onyinye maka ọrụ ebe nsọ a.” Nʼihi nke a, ndị mmadụ kwụsịrị iweta ihe ọzọ.
EXO 36:7 Nʼihi na onyinye e wetara adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ọrụ ahụ.
EXO 36:8 Ndị niile mara ǹka nʼetiti ndị ọrụ ahụ ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie wuo ụlọ nzute ahụ. Onye ọka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha.
EXO 36:9 Akwa mgbochi ndị a ha nʼotu. Ịdị ogologo ha nʼotu nʼotu bụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ha bụ otu mita na sentimita asatọ.
EXO 36:10 E jikọtara akwa mgbochi ise nʼotu, jikọtakwa akwa ise nke ọzọ nʼotu.
EXO 36:11 Ha ji akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka emekwara menyekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ.
EXO 36:12 Ha dụnyere iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ, mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu.
EXO 36:13 Emesịa, ha ji iri nko ọlaedo ise jikọta ụzọ akwa mgbochi abụọ ndị a, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ ghọọ otu.
EXO 36:14 Ha ji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ.
EXO 36:15 Akwa mgbochi iri na otu ndị a ha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo, ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ.
EXO 36:16 Ha dụkọtara ise nʼime akwa mgbochi ahụ, debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche.
EXO 36:17 Mgbe ahụ, ha dụnyekwara iri anya nko ise nʼelu ọnụ otu akwa mgbochi ndị ahụ. Mekwaa otu ihe ahụ nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ e debere iche.
EXO 36:18 Ha mekwara iri nko bronz ise, iji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu.
EXO 36:19 Mgbe ahụ, ha ji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ịkpụkwasị nʼelu ya.
EXO 36:20 Ha meere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.
EXO 36:21 Mbudo ibo ọ bụla dị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara,
EXO 36:22 nwee ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ha rụrụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.
EXO 36:23 Ha rụrụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ,
EXO 36:24 ma mekwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ.
EXO 36:25 Nʼakụkụ nke ọzọ bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ha rụkwara iri mbudo ibo abụọ,
EXO 36:26 rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
EXO 36:27 Nʼebe isi isi nsọtụ ya bụ akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute, ha rụrụ mbudo ibo isii.
EXO 36:28 Mbudo ibo abụọ ka e mere maka nkuku niile nke nsọtụ ụlọ nzute ahụ,
EXO 36:29 Nʼisi nkuku abụọ ndị a, mbudo ibo ndị a nọ iche iche site nʼokpuru ruo nʼelu ya; ma e jikọrọ ha ọnụ nʼime otu mgbaaka. Emere ka ha abụọ yie ibe ya.
EXO 36:30 Ha niile dị mbudo ibo asatọ na ụkwụ ọlaọcha dị iri na isii, ya bụ ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
EXO 36:31 Ha ji osisi akashia mekwaa osisi ntụbichi, ise maka mbudo ibo ndị dị nʼotu akụkụ nke ụlọ nzute ahụ,
EXO 36:32 ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ
EXO 36:33 Ha mere osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ka ọ gabiga site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ.
EXO 36:34 Ha ji ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile. Kpụkwaa mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta mkpọrọ osisi ahụ niile. Ha ji ọlaedo machiekwa mkpọrọ osisi ndị ahụ niile.
EXO 36:35 Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee akwa mgbochi. Onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
EXO 36:36 Ha mere ogidi osisi akashia anọ maka ya were ọlaedo machie ha. Ha meere ha anya nko; wukwara ha ụkwụ ọlaọcha anọ.
EXO 36:37 Ha mere akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ, nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
EXO 36:38 Ha rụrụ ogidi ise ya na anya nko ha. Ha ji ọlaedo machie isi ogidi ahụ na ihe mkpọrọ ha, were bronz rụọ ụkwụ ise ha.
EXO 37:1 Bezalel ji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya bụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya ga-abụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ.
EXO 37:2 O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie nʼime na azụ ya, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile.
EXO 37:3 Ọ kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnyekwa ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya.
EXO 37:4 O jikwa osisi akashia ahụ mee okporo osisi, machiekwa ha ọlaedo.
EXO 37:5 O tinyekwara mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ; ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.
EXO 37:6 Emesịa, o ji ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe e ji ekwuchi igbe ahụ. Aha a na-akpọ okwuchi igbe a bụ Oche Ebere. Ịdị ogologo ya dị otu mita na sentimita iri, obosara ya dị iri sentimita asaa.
EXO 37:7 Mgbe ahụ, o ji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa, kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ.
EXO 37:8 A rụnyere otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; nʼisi nsọtụ abụọ ahụ, ka o jikọtara ha ọnụ ka ha na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu.
EXO 37:9 Cherubim ndị a gbasara nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ cherịtara onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị.
EXO 37:10 Emesịa, o mere tebul nke ịdị ogologo ya bụ iri sentimita itoolu. Obosara ya bụ iri sentimita ise, ịla elu ya bụ iri sentimita asaa. Ọ bụ osisi akashia ka o ji mee ya.
EXO 37:11 Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji machie ya. A kpụnyekwara ihe ọkpụkpụ ọlaedo gburugburu ọnụ ọnụ ya.
EXO 37:12 A rụnyere ihe nʼọnụ ọnụ tebul ahụ nke ịla elu ya ga-eru sentimita asatọ. Ihe a dị gburugburu ọnụ ọnụ tebul ahụ, ọ bụkwa ọlaedo a kpụrụ akpụ ka e ji rụọ ya.
EXO 37:13 Ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ; kwụnyekwa ha nʼakụkụ anọ ahụ nʼebe ụkwụ anọ ya dị.
EXO 37:14 E tinyere mgbaaka ndị ahụ nso nso ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, e ji ebu tebul ahụ.
EXO 37:15 O jikwa osisi akashia mee okporo osisi ahụ e ji ebu tebul ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ya.
EXO 37:16 O mekwara ihe niile na-adị nʼelu tebul ahụ: efere, ngaji, ọkwa na iko, nke e ji awụpụ aja ihe ọṅụṅụ. Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka o ji kpụọ ha.
EXO 37:17 Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Ha kpụrụ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mekwaa ka iko ya niile yiri okoko osisi, nʼisi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya.
EXO 37:18 Alaka isii sitere nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ.
EXO 37:19 Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile dịkwa nʼotu alaka; iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ.
EXO 37:20 Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, enwere iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya.
EXO 37:21 Otu isi dị nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta, isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ, isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii.
EXO 37:22 Isi nwapụta ya na alaka ya niile dịkọtara ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ.
EXO 37:23 Ha mekwara oriọna asaa ya, ma mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile. Ha bụ ọlaedo a nụchara anụcha.
EXO 37:24 Ha sitere na iri kilogram atọ na anọ nke ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna ahụ na ngwongwo ya niile.
EXO 37:25 Ha ji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja a na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Akụkụ anọ ya ha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya bụ iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya bụ iri sentimita itoolu. Mpi ya niile si na ya pụta.
EXO 37:26 Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha machie elu ya; akụkụ ya niile nakwa mpi ya niile. Ha jikwa ọlaedo kpụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu.
EXO 37:27 Ha kpụnyere mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọ bụla, ebe a ga na-ejide mkpara e ji ebu ya.
EXO 37:28 Ha ji osisi akashia mee mkpara ndị ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ha.
EXO 37:29 Ha mekwara mmanụ otite dị nsọ, na ezigbo ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke a na-agwaghị ihe; bụ ọrụ nke onye na-eme mmanụ isi ụtọ.
EXO 38:1 Ha ji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Nke ịla elu ya dị otu mita na iri sentimita atọ. Ogologo ya na obosara ya ha nʼotu. Ha dị mita abụọ na iri sentimita atọ, mita abụọ na iri sentimita atọ.
EXO 38:2 Ha rụnyekwara mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ ghọọ nke e jikọtara nʼotu. Ha jikwa bronz machie ebe ịchụ aja a.
EXO 38:3 Ha ji bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ.
EXO 38:4 Ha mere ngịga mbadamba maka ebe ịchụ aja ahụ, ihe ọkpụkpa bronz, nke ga-adị nʼokpuru oghere ọnụ ọnụ ya.
EXO 38:5 Ha kpụrụ mgbaka bronz ndị a ga-eji jide mkpara ndị ahụ maka akụkụ anọ nke ngịga bronz ahụ.
EXO 38:6 Ha mere mkpara osisi akashia ndị a, were bronz machie ha.
EXO 38:7 Ha mere ka mkpara ndị ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ime ka ha dịrị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ maka iji nʼebu ya. Ha ji obodobo osisi rụọ ya dịka igbe.
EXO 38:8 Ha ji bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya. Ọ bụ enyo nke ndị inyom ahụ ndị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka e ji kpụọ ha.
EXO 38:9 Ọzọ, ha mere ogige ahụ. Ịdị ogologo nke nʼakụkụ ndịda dị iri mita anọ na ise. O nwere akwa mgbochi nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.
EXO 38:10 Iri ogidi abụọ ga-adị na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ. Anya nko ogidi ndị ahụ ha na ihe ikegide ha ga-abụ ọlaọcha.
EXO 38:11 Otu a kwa, akụkụ ugwu dịkwa iri mita anọ na ise. O nwere iri ogidi abụọ na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ, na anya nko nke ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.
EXO 38:12 Akụkụ ọdịda anyanwụ dị iri mita abụọ na atọ. Nwekwaa akwa mgbochi, nwere ogidi iri na ebe ndọkwasị iri, tinyere anya nko ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.
EXO 38:13 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe anwụ na-awalite dịkwa iri mita abụọ na atọ nʼobosara.
EXO 38:14 Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ bụ ihe dị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.
EXO 38:15 Otu a kwa, akwa mgbochi nke ịdị ogologo ya dị mita asaa bụ ihe dị nʼakụkụ nke ọzọ nke ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ. Ọ ga-enwekwa ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ
EXO 38:16 Akwa mgbochi niile nke ogige ahụ gburugburu bụ ezi akwa ọcha a kpara nke ọma.
EXO 38:17 Ogidi ọbụla nwere ihe ndọkwasị bronz. Nko niile na ihe njikọta niile ka e jikwa ọlaọcha machie. Ọ bụkwa naanị ọlaọcha ka e ji mee okporo osisi ndị ahụ.
EXO 38:18 Akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ bụ ihe e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee; akaọrụ nke onye na-akpa ihe ịchọ mma. Ọ dị mita itoolu nʼogologo, yikwaa akwa mgbochi nke ebe ogige ahụ, dị mita abụọ na iri sentimita atọ nʼịdị elu.
EXO 38:19 Ọ bụ ogidi anọ ka e ji jidesie ha ike na ihe ndọkwasị bronz anọ, nko na okporo osisi ha niile bụ ọlaọcha. E jikwa ọlaọcha machie isi ogidi ndị ahụ.
EXO 38:20 Ǹtu niile nke ụlọ nzute ahụ nakwa nʼogige ya gburugburu bụ bronz ka e ji kpụọ ha.
EXO 38:21 Ndị a bụ ngwongwo niile e ji wuo ụlọ nzute ahụ; ebe a ga-edebe Ihe Ama ahụ. Ọ bụ ndị Livayị depụtara ihe niile ndị a nʼusoro dịka Mosis si nye ha nʼiwu. Ọ bụkwa Itama, nwa Erọn onye nchụaja, lekọtara ndị niile rụrụ ọrụ idekọta ya.
EXO 38:22 Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda, rụzuru ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.
EXO 38:23 Onye na-enyere ya aka bụ Oholiab nwa Ahisamak, onye ebo Dan, bụ onye ọka a maara aha ya, ọ bụ onye ọka ihe ọtụtụ, na onye ọka ịdụnye ihe ịchọ mma dị iche iche nʼakwa na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha.
EXO 38:24 Ịdị arọ nke onyinye ọlaedo niile sitere nʼaja mfufe ahụ nke ndị mmadụ wetara maka ịrụ ebe nsọ ahụ, bụ otu puku na narị kilogram ise.
EXO 38:25 Ịdị arọ nke ọlaọcha enwetara nʼaka ọgbakọ ahụ, bụ puku kilogram anọ, na narị kilogram isii na iri ise dịka shekel ebe nsọ si dị.
EXO 38:26 Ha niile tụrụ otu beka, otu isi, dịka ụtụ mgbe e kere ụtụ ọkara shekel dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị, e nyere nʼisi onye ọbụla nke gabigara nʼebe ndị a gụrụ ọnụ nọ, bụ ndị gbara iri afọ abụọ rigoo. Ọnụọgụgụ ha dị narị isii, na puku atọ, na narị ise, na iri ise.
EXO 38:27 Ịdị arọ nke ọlaọcha niile e ji rụọ ụkwụ ibo niile nke ebe nsọ ahụ, na ụkwụ ogidi niile e ji jidesie akwa mgbochi ndị ahụ ike bụ puku kilogram atọ, na narị kilogram isii. Ịdị arọ nke ọlaọcha e ji wuo ụkwụ ọbụla bụ iri kilogram atọ na isii.
EXO 38:28 Ịdị arọ nke ọlaọcha e ji menye nko nʼibo osisi niile, na nke e ji machie okporo osisi niile, na nke e ji techie isi ogidi osisi niile, bụ iri kilogram abụọ.
EXO 38:29 Ịdị arọ nke bronz niile ndị mmadụ wetara dịka onyinye aja mfufe bụ puku kilogram atọ, na narị kilogram atọ, na iri isii.
EXO 38:30 E ji bronz ndị a wuo ụkwụ ogidi niile a manyere nʼihu ụzọ e si abata ogige ụlọ nzute ahụ. E jikwa ya wuo ebe ịchụ aja bronz ahụ, na ihe ọkpụkpụ bronz ahụ, na ngwongwo niile e ji eje ozi nʼebe ịchụ aja,
EXO 38:31 na ụkwụ ogidi a manyere nʼihu ụlọ nzute, na ǹtu niile e ji wuo ụlọ nzute ahụ, na ogige gbara ya gburugburu.
EXO 39:1 Ha sitekwara nʼogho akwa na-acha anụnụ anụnụ na nke na-acha ngwakọta anụnụ na uhie (odo odo), nke na-acha uhie uhie, meere ndị nchụaja uwe akpara akpa nke ọma iyi jee ozi nʼebe nsọ ahụ. Ha meekwara Erọn uwe nsọ, nʼusoro iwu Onyenwe anyị nyere Mosis.
EXO 39:2 Ha ji ogho ọlaedo, na nke na-acha anụnụ anụnụ, nke na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, na nke na-acha uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee efọọd ahụ.
EXO 39:3 Ha tipịara mpempe ọlaedo ndị ahụ mee ka ọ dị mbadamba. Bipụtasịa ha ntakịrị ntakịrị dịka eriri maka i ji ha kpanye nʼetiti ogho ndị a na-acha anụnụ anụnụ; ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
EXO 39:4 Ha dụrụ akwa na-adị nʼubu maka efọọd ahụ, nke e jikọtara na nkuku ya abụọ, maka i ji na-ekechisi ya ike.
EXO 39:5 Ihe okike nke ukwu ahụ, nke onye ǹka kpaziri nke ọma yiri ya, ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
EXO 39:6 Ha doziri nkume ọniks ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa; ma gbunye aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu ya dịka onye ọka si egbunye aha mmadụ nʼelu mgbaaka akara.
EXO 39:7 Ha jikọtara ha nʼelu akwa ubu nke efọọd ahụ, ka ọ bụrụ nkume ncheta mgbe ebighị ebi nye ụmụ Izrel, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
EXO 39:8 Ha mekwara ihe mgbochi obi, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Ha mere ya dịka e si mee efọọd ahụ. Ọ bụ ogho edo edo, nke na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma ka e ji mee ya.
EXO 39:9 Ọ ha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara; nke apịajiri ụzọ abụọ.
EXO 39:10 Mgbe ahụ, ha hịọnyere ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa nʼime ya. Ụdị dị nʼahịrị nke mbụ bụ: nkume kanelian, krisolaịt na beril,
EXO 39:11 nʼahịrị nke abụọ bụ: nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.
EXO 39:12 Nʼahịrị nke atọ bụ: nkume jasint, ageeti na ametisiti.
EXO 39:13 Nʼahịrị nke anọ bụ: nkume topaazi, ọniks na jaspa. Ahịọnyere ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa.
EXO 39:14 Ha dị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.
EXO 39:15 Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi.
EXO 39:16 Ha mere ihe ọlaedo abụọ nke a kpara akpa, ya na mgbaaka ọlaedo abụọ. Dụnyekwa mgbaaka ndị ahụ na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ.
EXO 39:17 Ha dụnyere ụdọ ọlaedo abụọ ndị ahụ nʼelu mgbaaka ndị ahụ dị na nkuku ihe mgbochi obi ahụ.
EXO 39:18 Were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa. Konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya.
EXO 39:19 Ha mere mgbaaka ọlaedo. Konyekwa ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ, nʼime ọnụ ọnụ ya ebe dị nso efọọd ahụ.
EXO 39:20 Mgbe ahụ, ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konyekwa ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe ihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ.
EXO 39:21 Ha jikwa eriri na-acha anụnụ kekọta mgbaaka ihe mgbochi obi ahụ na mgbaaka efọọd ahụ, jikọta ya na ihe okike ukwu ahụ, ime ka ihe mgbochi obi ahụ hapụ ịtọghapụ site nʼefọọd ahụ, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
EXO 39:22 Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ha ji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ, ọrụ onye okwe akwa.
EXO 39:23 A ga-enwe oghere nʼetiti uwe mwụda ahụ, dịka oghere olu uwe agha, nwekwa akwa nta a dụnyere nʼokpuru oghere a, ime ka o sie ike gharakwa ịdọka.
EXO 39:24 Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma kpanye oyiyi mkpụrụ pomegranet, gburugburu nʼọnụ ala ala uwe mwụda ahụ.
EXO 39:25 Ha dụnyekwara ataṅụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, gburugburu nʼọnụ ọnụ ala ya nʼetiti pomegranet ndị ahụ.
EXO 39:26 Otu ataṅụ, otu oyiyi mkpụrụ pomegranet, otu a ka a dụnyere ya gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ahụ, nke a ga-eyi mgbe a na-eje ozi, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
EXO 39:27 Ha ji ezi akwa ọcha metara Erọn na ụmụ ya ndị ikom, uwe ime ahụ, akaọrụ nke onye ọkpa akwa,
EXO 39:28 jirikwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi, okpu akwa ọcha, na uwe ukwu nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma.
EXO 39:29 Ihe ike nʼukwu bụ nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie uhie, na uhie uhie, nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma, dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.
EXO 39:30 Ha mere efere, bụ okpu nsọ ahụ, site nʼọlaedo a nụchara anụcha, gbunyekwa akara nʼelu ya, dịka ihe e dere nʼelu mgbaaka akara: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
EXO 39:31 Mgbe ahụ, ha kenyere ya eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.
EXO 39:32 Otu a ka ha si rụchaa ọrụ iwu ụlọ nzute ahụ. Ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.
EXO 39:33 Mgbe ahụ, ha buteere Mosis ụlọ nzute ahụ: ụlọ ikwu ahụ ya na ngwongwo ya niile, ya bụ nko ya niile, mbudo ibo ya niile, mkpọrọ osisi ya niile, ogidi ya niile na ụkwụ ya niile,
EXO 39:34 na akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri e ji emechi elu ụlọ nzute ahụ, na akwa mgbochi,
EXO 39:35 na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, ya na mkpara e ji ebu ya, na oche ebere ya,
EXO 39:36 na tebul ahụ, ya na ngwongwo ya niile na achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị,
EXO 39:37 na ihe ịdọkwasị oriọna e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, na iheọkụ ya niile na ngwongwo ya niile, na mmanụ oliv maka ịmụ ọkụ,
EXO 39:38 na ebe ịchụ aja ọlaedo, mmanụ nsọ na ụda na-esi isi ụtọ na akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ ụlọ nzute,
EXO 39:39 na ebe ịchụ aja bronz ahụ, na ihe ọkpụkpa bronz ya, mkpara ya niile na ngwongwo ya niile, efere ukwu ahụ ya na ihe ndọkwasị ya,
EXO 39:40 akwa mgbochi nke ogige ụlọ ahụ, na ogidi ya na ihe ndọkwasị ya nakwa akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ e si abanye nʼogige ahụ; ụdọ na ǹtu ịkpọgide ogige ahụ; ngwongwo niile nke ụlọ nzute ahụ, ụlọ ikwu nzute ahụ
EXO 39:41 na uwe niile a kpara akpa, nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja, na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja.
EXO 39:42 Ndị Izrel niile rụzuru ọrụ ndị a niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.
EXO 39:43 Mosis nʼonwe ya hụkwara ọrụ ndị a niile, nabata ya ka nke e jere dịka iwu Onyenwe anyị nyere si dị. Nʼihi ya, Mosis gọziri ha.
EXO 40:1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
EXO 40:2 “Guzobe ụlọ nzute ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ.
EXO 40:3 Dọnye igbe ọgbụgba ndụ nke Ihe Ama ahụ nʼime ya. Konyekwa akwa mgbochi nke ga-ezo ya.
EXO 40:4 Webata tebul ahụ, na ngwongwo dị nʼelu ya, webatakwa ihe ịdọba oriọna ahụ. Mụnyekwa oriọna ndị ahụ ọkụ.
EXO 40:5 Doo ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nke e mere maka ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nke kwesiri ịdị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ nzute ahụ.
EXO 40:6 “Doo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nʼihu ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọ nzute bụ ụlọ ikwu ahụ.
EXO 40:7 Dọnye efere ukwu ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja ahụ. Gbajukwaa ya mmiri.
EXO 40:8 Guzobe ogige gburugburu ụlọ nzute ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ogige ahụ.
EXO 40:9 “Were mmanụ nsọ ahụ tee ụlọ nzute ahụ, ya na ihe niile dị nʼime ya, si otu a doo ha nsọ ma ngwongwo ịchọ mma ya niile. Ọ ga-abụ ebe dị nsọ.
EXO 40:10 Mgbe ahụ, tee ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ mmanụ ya na ihe ya niile e ji eje ozi. Doo ebe ịchụ aja ahụ nsọ, ọ ga-abụkwa ebe dịkarịsịrị nsọ.
EXO 40:11 Tekwaa efere ukwu ịsa mmiri ahụ na ụkwụ ya mmanụ. Doo ha nsọ.
EXO 40:12 “Kpọbata Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Jiri mmiri saa ha ahụ nʼebe ahụ.
EXO 40:13 Yikwasị Erọn uwe nsọ ya. Tekwaa ya mmanụ, ido ya nsọ maka i jere m ozi dịka onye nchụaja.
EXO 40:14 Mekwaa ka ụmụ ya ndị ikom bịaruo nso, yikwasịkwa ha uwe ime ahụ.
EXO 40:15 Tee ha mmanụ dịka i si tee nna ha, ime ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Otite mmanụ ha ga-abụ nye ọrụ nchụaja ha nke ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
EXO 40:16 Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ime.
EXO 40:17 O ruo, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ, nʼafọ nke abụọ, e mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ.
EXO 40:18 Mosis mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ site nʼitinye mbudo ibo ya niile, ụkwụ ya na mkpọrọ osisi ya niile nʼọnọdụ ha.
EXO 40:19 Emesịa, ọ gbasapụrụ ihe mkpuchi nʼelu ụlọ nzute ahụ, tụkwasịkwa okpukpu ihe mkpuchi nke abụọ nʼelu ya dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu.
EXO 40:20 O tinyere Ihe Ama nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Emesịa, ọ tụkwasịkwara mkpara e ji ebu igbe ahụ nʼakụkụ igbe ahụ, were okwuchi igbe ahụ, nke bụ Oche Ebere ahụ, kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
EXO 40:21 Emesịa, o bubatara igbe ahụ nʼime ụlọ nzute ahụ, kwụnyekwa akwa mgbochi nke mgbochi, kewapụ igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
EXO 40:22 Mosis dọnyere tebul ahụ nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi ahụ.
EXO 40:23 Ọ dọkwasịrị achịcha ahụ a na-edo nʼihu Onyenwe anyị nʼelu tebul ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
EXO 40:24 Ọ dọkwasịrị ihe ịdọba oriọna ahụ nʼime ụlọ nzute nʼakụkụ tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
EXO 40:25 Ọ mụnyere oriọna ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka Onyenwe anyị si nye nʼiwu.
EXO 40:26 Mosis debere ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nʼime ụlọ nzute nso nso ebe akwa mgbochi ahụ dị,
EXO 40:27 surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ya, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
EXO 40:28 Ọ kwụbara akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
EXO 40:29 Debekwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nso ọnụ ụzọ ịba ụlọ nzute ahụ. O surekwara aja nsure ọkụ nʼelu ya, na aja onyinye mkpụrụ ọka dịka Onyenwe anyị si nye ya nʼiwu.
EXO 40:30 Ọ dọbara efere ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja, wụjuo ya mmiri, maka iji sachaa ihe.
EXO 40:31 Mosis, na Erọn, na ụmụ ya ndị ikom na-eji ya akwọcha aka ha, sakwaa ụkwụ ha.
EXO 40:32 Mgbe ọbụla ha na-abanye nʼụlọ nzute na mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja, ha na-asacha, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.
EXO 40:33 Mosis guzobere ogige ahụ gburugburu ụlọ nzute ahụ na ebe ịchụ aja ahụ. O konyekwara akwa mgbochi nʼụzọ mbata nke ogige ụlọ nzute ahụ. Otu a, Mosis rụzuru ọrụ niile ahụ.
EXO 40:34 Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼime ya.
EXO 40:35 Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọ nzute ahụ.
EXO 40:36 Nʼime njegharị ha niile, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, mgbe ahụ ka ụmụ Izrel na-ebuli njem.
EXO 40:37 Ma ọ bụrụ na igwe ojii ahụ ebilighị, ụmụ Izrel adịghị ebulikwa njem tutuu ruo mgbe o biliri.
EXO 40:38 Igwe ojii Onyenwe anyị ahụ na-anọgide nʼelu ụlọ nzute ahụ nʼehihie ma nʼabalị, ọkụ na-esi nʼime ya na-enwupụta. Ndị Izrel niile na-ahụkwa ya anya ụbọchị niile nke ha jegharịrị nʼọzara.
LEV 1:1 Onyenwe anyị sitere nʼụlọ nzute ahụ kpọ Mosis oku, gwa ya sị,
LEV 1:2 “Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Mgbe onye ọbụla nʼime unu wetaara Onyenwe anyị onyinye, ka onyinye ọ ga-eweta bụrụ anụ ụlọ si nʼetiti igwe ehi maọbụ igwe ewu na atụrụ.
LEV 1:3 “ ‘Ọ bụrụ na ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ e wetara site nʼigwe ehi, ọ bụ oke ehi nke na-enweghị ntụpọ ka ọ ga-eweta. Nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka ọ ga-eweta ya, ka ọ bụrụ ihe Onyenwe anyị ga-anabata.
LEV 1:4 Onye ahụ wetara ya ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ aja nsure ọkụ ahụ, a ga-anabata ya maka iji kpuchie mmehie ya.
LEV 1:5 Nwoke ahụ ga-egbu nwa oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja ga-ewere ọbara ya fesa ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja, nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ nzute ahụ.
LEV 1:6 Ị ga-agba ehi aja nsure ọkụ ahụ akpụkpọ, bọkasịa ya ntakịrị ntakịrị.
LEV 1:7 Ụmụ Erọn, ndị nchụaja ga-etinye ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ, doo nkụ nʼusoro nʼelu ya.
LEV 1:8 Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ndị nchụaja ga-atụkwasị akụkụ ehi ahụ niile, na isi ya, na abụba ya, nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ.
LEV 1:9 Ma a ga-asacha ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya mmiri. Onye nchụaja ga-akpọ ha niile ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ nke dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.
LEV 1:10 “ ‘Ọ bụrụ na onyinye aja nsure ọkụ ahụ si nʼigwe ewu na atụrụ, ọ ga-abụrịrị mkpi maọbụ ebule na-enweghị nkwarụ.
LEV 1:11 Onye wetara ya ga-egbu ya nʼihu Onyenwe anyị nʼakụkụ ebe ịchụ aja chere ihu nʼugwu. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
LEV 1:12 Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ wetara ya, ga-abọ ya. Onye nchụaja ga-ewere akụkụ ya niile, na isi ya, na abụba ya tụkwasị ha nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ dị nʼebe ịchụ aja.
LEV 1:13 Ma ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, ka onye ahụ ga-asa mmiri, tupu onye nchụaja eweta ha niile kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.
LEV 1:14 “ ‘Ọ bụrụ na onyinye ọ na-enye Onyenwe anyị dịka aja nsure ọkụ bụ site nʼụmụ anụ ufe, ọ ghaghị ịbụ nduru, maọbụ nwa kpalakwukwu.
LEV 1:15 Onye nchụaja ga-ewebata anụ ufe ahụ nʼebe ịchụ aja, tụbipụ isi ya, wụsa ọbara ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja.
LEV 1:16 Ọ ga-ewepụ akpa nri ya, na ihe dị ya nʼime, tụnye ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja ahụ; ebe a na-ekposa ntụ.
LEV 1:17 Ọ ga-ejide nku ya abụọ nyawaa ha, ma ọ gaghị anyakapụcha ha. Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-akpọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.
LEV 2:1 “ ‘Mgbe onye ọbụla wetaara Onyenwe anyị onyinye mkpụrụ ọka, onyinye ya ga-abụ nke ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma. Ha ga-awụkwasị ya mmanụ oliv, tinyekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ya,
LEV 2:2 ọ ga-ebutere ya ụmụ Erọn ndị nchụaja. Onye nchụaja ga-ekpoju ụtụ ọka na mmanụ ahụ nʼaka, tinyekwara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile ahụ, kpọọ ihe ndị a ọkụ dịka oke ncheta nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ ga-abụkwa onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.
LEV 2:3 Ma nke fọdụrụ nʼonyinye ọka ahụ bụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ nke onyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 2:4 “ ‘Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha eghere nʼite e ji eghe ihe, ọ ga-abụ nke e ji ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma mee. Ọ ga-abụ ogbe achịcha agwara mmanụ oliv nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, maọbụ achịcha mbadamba e tere mmanụ nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
LEV 2:5 Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha e ghere eghe, achịcha ahụ aghaghị ịbụ nke e mere site nʼezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma, nke a gwakọtara mmanụ, nke na-enweghị ihe na-eko achịcha nʼime ya.
LEV 2:6 Nyawasịa ya, wụkwasị ya mmanụ nʼelu, ọ bụkwa onyinye mkpụrụ ọka.
LEV 2:7 Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka gị bụ ihe e siri nʼite, ọ ghaghị ịbụ ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma, e tinyetụrụ mmanụ oliv.
LEV 2:8 Ị ga-ebute onyinye mkpụrụ ọka ahụ bunye ya onye nchụaja. Ọ ga-eche ya nʼihu Onyenwe anyị nʼebe ịchụ aja.
LEV 2:9 Onye nchụaja ga-ekporo ụfọdụ nʼaka dịka oke ncheta nʼime onyinye ọka ahụ, kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka aja e surere nʼọkụ, nke isisi ya na-atọ Onyenwe anyị ezi ụtọ.
LEV 2:10 Ma nke fọdụrụ nʼonyinye ọka ahụ bụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ nke onyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 2:11 “ ‘Unu etinyela ihe na-eko ọka ọbụla nʼonyinye mkpụrụ ọka unu na-enye Onyenwe anyị, nʼihi na unu ekwesighị ịkpọ ihe na-eko achịcha maọbụ mmanụ aṅụ ọkụ nʼonyinye nsure ọkụ unu na-enye Onyenwe anyị.
LEV 2:12 Unu nwere ike nye Onyenwe anyị achịcha e ji ihe na-eko achịcha na mmanụ aṅụ mee nʼoge onyinye owuwe ihe ubi, ma a gaghị eme otu a nʼoge onyinye ọchụchụ aja nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ.
LEV 2:13 Unu aghaghị itinye nnu nʼime onyinye mkpụrụ ọka ọbụla unu na-enye. Unu ahapụla ọgbụgba ndụ Chineke unu nʼonyinye mkpụrụ ọka unu. Tinyenụ nnu nʼonyinye unu niile.
LEV 2:14 “ ‘Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka ị na-ewetara Onyenwe anyị bụ mkpụrụ mbụ nke ubi gị, site nʼọka ọhụrụ gị weta ọka a sụrụ asụ, maọbụ nke a hụrụ nʼọkụ.
LEV 2:15 Tinye ya mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ. Ọ ga-abụ onyinye ọka.
LEV 2:16 Onye nchụaja ga-ewere oke ncheta nʼime ọka ahụ a sụrụ asụ, nke a gwara mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ, dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
LEV 3:1 “ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ inye onyinye aja udo, o nwere ike jiri anụ ụlọ si nʼigwe ehi, oke ehi maọbụ nwunye ehi. Ma anụ ahụ ọ ga-ewebata nʼihu Onyenwe anyị aghaghị ịbụ ehi na-enweghị nkwarụ.
LEV 3:2 Onye ahụ wetara ya, ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Mgbe ahụ ụmụ Erọn ndị ikom, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
LEV 3:3 Site nʼonyinye aja udo, ị ga-eweta onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na abụba niile nke metụtara ha,
LEV 3:4 akụrụ ya abụọ na abụba nke dị nʼelu ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya na abụba kpuchiri umeju ya, nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
LEV 3:5 Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ga-esunye ha ọkụ nʼelu aja nsure ọkụ a tụkwasịrị nʼosisi e sunyere ọkụ, ọ bụ onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.
LEV 3:6 “ ‘Ọ bụrụ na onyinye aja udo a na-achụrụ Onyenwe anyị bụ site nʼigwe ewu maọbụ atụrụ, ọ ghaghị ịbụ mkpi maọbụ nne ewu na-enweghị ntụpọ.
LEV 3:7 Ọ bụrụ onyinye atụrụ, onye ahụ ga-ewebata ya nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 3:8 Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi atụrụ ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ndị nchụaja, ụmụ Erọn, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
LEV 3:9 Ị ga-esite nʼonyinye aja udo a, weta onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba ya, na abụba niile dị nʼọdụdụ ya nke a ga-esite nʼakụkụ ọkpụkpụ azụ ya bepụta, na abụba kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya; na abụba niile nke metụtara ha,
LEV 3:10 na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
LEV 3:11 Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
LEV 3:12 “ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla eweta ewu dịka onyinye ọ na-eche nʼihu Onyenwe anyị,
LEV 3:13 ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi ewu ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
LEV 3:14 Ọ bụ site nʼonyinye nke i wetara ka ị ga-esi chee onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na abụba niile metụtara ha,
LEV 3:15 na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na ihe kpuchiri umeju ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
LEV 3:16 Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ. Abụba niile bụ nke Onyenwe anyị.
LEV 3:17 “ ‘Iwu ndị a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Unu ga-edebezu ya nʼebe ọbụla unu bi. Unu agaghị eri abụba maọbụ ọbara ọbụla.’ ”
LEV 4:1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 4:2 “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, megide ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu:
LEV 4:3 “ ‘Ọ bụrụ na onye nchụaja e tere mmanụ emehie na-amaghị ama, si otu a weta ikpe ọmụma nʼisi ọha mmadụ. Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị otu oke ehi na-enweghị ntụpọ dịka aja mmehie, nʼihi mmehie ahụ o mere.
LEV 4:4 Ọ ga-ewere oke ehi ahụ bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi ya, gbuo ya nʼebe ahụ nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 4:5 Mgbe ahụ, onye nchụaja e tere mmanụ ga-eburu ụfọdụ ọbara oke ehi ahụ baa nʼime ụlọ nzute.
LEV 4:6 Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ, fesa ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu akwa mgbochi nke ebe nsọ ahụ.
LEV 4:7 Onye nchụaja ga-etekwasị ụfọdụ ọbara ahụ na mpi dị nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, nʼihu Onyenwe anyị nʼime ụlọ nzute. Ọbara fọdụrụ nʼoke ehi ahụ ka ọ ga-awụsa nʼụkwụ ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ, nʼọnụ ụzọ ịba ụlọ nzute.
LEV 4:8 Ọ ga-ewepụ abụba niile site nʼoke ehi aja mmehie, abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na nke jikọtara ha,
LEV 4:9 na akụrụ ya abụọ na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na ihe kpuchiri umeju ya, nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya,
LEV 4:10 dịka e si ewepụ abụba oke ehi e ji chụọ aja udo. Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ.
LEV 4:11 Ma akpụkpọ anụ oke ehi ahụ na ahụ ya niile, ma isi ya, na ụkwụ ya, na ihe dị nʼime afọ ya, na mgbịrị afọ ya,
LEV 4:12 ihe niile fọdụrụ nʼoke ehi ahụ, ka a ga-ebupu nʼazụ ebe obibi ụmụ Izrel, ebe dị ọcha, ebe a na-ekpofu ntụ. Ebe ahụ ka a ga-anọ kpọọ ya ọkụ, nʼọkụ a kwanyere nʼebe a na-ekpofu ntụ.
LEV 4:13 “ ‘Ọ bụrụ na nzukọ Izrel niile emehie na-amaghị ama, mee ihe ọbụla megidere ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, ọ bụ ezie na ndị obodo amaghị okwu a, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha
LEV 4:14 matakwa mmehie ha mehiere, nzukọ ahụ aghaghị iweta nwa oke ehi dịka aja mmehie, duru ya chee ya nʼihu ụlọ nzute.
LEV 4:15 Ndị okenye nzukọ Izrel ga-ebikwasị aka ha nʼisi oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. A ga-egbu ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 4:16 Mgbe ahụ, onye nchụaja e tere mmanụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara ya baa nʼụlọ nzute.
LEV 4:17 Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ fesa ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu akwa mgbochi ahụ.
LEV 4:18 Ọ ga-ete ọbara ụfọdụ nʼelu mpi nke dị nʼebe ịchụ aja nke dị nʼihu Onyenwe anyị, nʼụlọ nzute. Ọ ga-awụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala, nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
LEV 4:19 Ọ ga-ewepụta abụba niile dị ya nʼahụ kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.
LEV 4:20 Ọ ga-eme oke ehi ahụ ihe o mere oke ehi aja mmehie. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchi mmehie ndị Izrel. A ga-agbagharakwa ha.
LEV 4:21 Emesịa, onye nchụaja ga-eburu ozu oke ehi ahụ gaa nʼazụ obodo kpọọ ya ọkụ nʼebe ahụ, dịka o mere oke ehi nke mbụ. Nke a bụ aja mmehie nʼihi nzukọ Izrel.
LEV 4:22 “ ‘Mgbe otu nʼime ndịisi obodo mehiere na-amaghị ama, si otu a megide ihe Onyenwe anyị Chineke nyere nʼiwu banyere ihe a na-agaghị eme, mgbe ọ ghọtara ikpe ọmụma ya.
LEV 4:23 Ọ bụrụkwa na-eme ka ọ mata mmehie ya, ọ ghaghị iweta mkpi na-enweghị nkwarụ dịka onyinye nʼihi mmehie ya.
LEV 4:24 Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi mkpi ahụ. Gbuo ya nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ aja mmehie.
LEV 4:25 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya tee ya nʼelu mpi ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Nke fọdụrụ ka ọ ga-awụpụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja.
LEV 4:26 Ọ ga-akpọ abụba ya niile ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka o si kpọọ abụba anụ e ji chụọ aja udo ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri onyeisi ahụ mmehie ya. A ga-agbaghara ya.
LEV 4:27 “ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼetiti ndị obodo ahụ emehie na-amaghị ama, mee ihe megidere ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha,
LEV 4:28 ọ bụrụkwa na-amata mmehie ha mere, ha ga-eweta nne ewu na-enweghị ntụpọ dịka onyinye nʼihi mmehie ya.
LEV 4:29 Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼelu isi aja mmehie ahụ, e gbuo ya nʼebe a na-achụ aja nsure ọkụ.
LEV 4:30 Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara ahụ na mkpịsịaka ya tee ya na mpi nke ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja.
LEV 4:31 Ọ ga-ewepụ abụba ya niile dịka a na-eme nʼaja udo. Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja, dịka ihe na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja a ga-ekpuchikwara ha mmehie. A ga-agbagharakwa ha.
LEV 4:32 “ ‘Ma ọ bụrụ na mmadụ eweta otu atụrụ dịka onyinye nʼihi aja mmehie ya, ọ ghaghị ịbụ nne atụrụ na-enweghị ntụpọ.
LEV 4:33 Ọ ga-eweta ya nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ebikwasị ya aka nʼisi, gbuo ya nʼebe ahụ, ka ọ bụrụ aja mmehie ya.
LEV 4:34 Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara anụ aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya, tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja.
LEV 4:35 Ha ga-ewepụ abụba ya niile, dịka a na-eme nʼatụrụ aja udo. Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ a chụrụ nye Onyenwe anyị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie nʼihi iwu ha dara. A ga-agbaghara ha mmehie ha.
LEV 5:1 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie nʼihi na ọ jụrụ ikwupụta mgbe ọ nụrụ ọkwa amaara nʼọha maka ịgba ama banyere ihe ọ hụrụ maọbụ ihe ọ maara, ọ bụ onye ikpe mara.
LEV 5:2 “ ‘Onye na-amaghị ama metụ ihe rụrụ arụ aka, dịka ozu anụ ọbụla iwu megidere, maọbụ anụ ụlọ, maọbụ anụ ọhịa, maọbụ anụ ọbụla na-akpụ akpụ nʼala. Ọ ghọọla onye rụrụ arụ, na onye ikpe mara.
LEV 5:3 Ma ọ bụrụ na ha emetụ ihe ọbụla rụrụ arụ si nʼahụ mmadụ pụta aka, ihe ọbụla ga-eme ya ka ọ hapụ ịdị ọcha, ọ bụ ezie na ha amaghị na ọ bụ ihe rụrụ arụ, mgbe ọ matara ya, ọ ga-abụ onye ikpe mara.
LEV 5:4 Ọ bụrụ na mmadụ a ṅụọ iyi nzuzu, nke ga-akwagide ya ime ihe ọbụla maọbụ ihe dị mma, maọbụ ihe dị njọ, mgbe onye ahụ ghọtara na ọ bụ iyi nzuzu ka ọ ṅụrụ, ọ bụrụla onye ikpe mara.
LEV 5:5 Onye ọbụla sitere nʼụzọ dị otu a bụrụ onye ikpe mara, ga-ekwupụta mmehie ya, dịka o si dị.
LEV 5:6 Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị nne atụrụ, maọbụ nne ewu site nʼigwe ewu na atụrụ, dịka aja ikpe ọmụma maka mmehie ha mere. Onye nchụaja ga-achụrụ ha aja mkpuchi mmehie maka mmehie ha.
LEV 5:7 “ ‘Ọ bụrụ na o nweghị ike iweta atụrụ, ọ ga-ewetara Onyenwe anyị nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, dịka ihe ikpe ọmụma mmehie ha. Otu nʼime nnụnụ ndị a ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ.
LEV 5:8 Ọ ga-eweta ha nye onye nchụaja. Onye ga-ewere nnụnụ nke mbụ chụọ aja mmehie. Ọ ga-atụbipụ olu ya, kama ọ gaghị ekewapụcha isi nnụnụ ahụ site nʼahụ ya.
LEV 5:9 Ọ ga-efesa ụfọdụ ọbara aja mmehie ahụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ma ọbara fọdụrụ ka ọ ga-awụsa nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. Nke a ga-abụ aja mmehie.
LEV 5:10 Onye nchụaja ga-eji nnụnụ nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ. Ọ ga-agbaso usoro e debere maka ịchụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ekpuchikwara ha mmehie ha mere. A ga-agbagharakwa ha.
LEV 5:11 “ ‘Ọ bụrụ na onye ahụ enweghị ike iweta nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-eweta iko ọka asaa a kwọrọ nke ọma ka ọ bụrụ onyinye aja mmehie. Ọ gaghị etinye ya mmanụ oliv na ụda na-esi isi ụtọ, nʼihi na ọ bụ aja mmehie.
LEV 5:12 Ha ga-ewere ya bịakwute onye nchụaja, onye ga-ekporo nke ga-eju ya aka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja nke onyinye nsure ọkụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Nke a ga-abụkwa aja mmehie ya.
LEV 5:13 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja ikpuchi mmehie ya niile. A ga-agbagharakwa ya. Ụtụ ọka fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja, dịka e si mee ya nʼaja onyinye mkpụrụ ọka.’ ”
LEV 5:14 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 5:15 “Mgbe onye ọbụla sitere na-amaghị ama mehie, merụọ ihe nsọ niile nke Onyenwe anyị, bụrụ onye nke nʼekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, dịka ọnụahịa ya si dị nʼọlaọcha, nʼusoro shekel nke ebe nsọ. Ọ bụ aja ikpe ọmụma.
LEV 5:16 Ọ ga-akwụghachikwa ụgwọ ihe nsọ ndị ahụ niile nke ọ na-emezughị. Ọ ga-atụkwasị otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya nʼelu ya, were ha niile nye onye nchụaja. Onye nchụaja ahụ ga-ewere ebule ahụ na ihe ndị a chụọrọ ya aja mkpuchi mmehie, nʼihi ikpe ọmụma ya. A ga-agbagharakwa ya.
LEV 5:17 “Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie, mee ihe ọbụla megidere iwu ọbụla Onyenwe anyị nyere, ọ bụ ezie na e mere mmehie a na-amaghị ama, ma ikpe mara ha, ọ ga-atakwa ahụhụ soo ya.
LEV 5:18 Ọ ga-ewetara onye nchụaja ihe aja ikpe ọmụma nke bụ otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ga-abụ ihe o ruru. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja mkpuchi mmehie nʼihi ihe ọjọọ o mere na-amaghị ama. A ga-agbaghara ya mmehie ya.
LEV 5:19 Ọ bụ aja ikpe ọmụma, nʼihi na onye mehiere megide Onyenwe anyị ka ọ bụ.”
LEV 6:1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 6:2 “Ọ bụrụ na onye ọbụla emehie bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, site nʼiduhie onye agbataobi ya banyere ihe e tinyere ya nʼaka idebe, maọbụ izunarị mmadụ ihe, maọbụ iji aghụghọ nara mmadụ ibe ya ihe;
LEV 6:3 maọbụ site nʼijide ihe furu efu nke ọ chọtara ghaa ụgha banyere ya. Ma ọ bụrụ na ha a ṅụọ iyi na ha ejighị ya, maọbụ gbasara ụdị mmehie mmadụ pụrụ ime.
LEV 6:4 Mgbe ha mehiere nʼụzọ ọbụla nʼime ụzọ ndị a niile, ghọta na ikpe mara ha. Ha aghaghị inyeghachi onye nwe ihe ahụ ha zuru nʼohi, maọbụ ihe ha pụnara nʼike, maọbụ ihe e nyere ya idebe, ma ọ bụkwanụ ihe ahụ furu efu ọ chọtara,
LEV 6:5 maọbụ ihe ọbụla ọ ṅụrụ nʼiyi ụgha. Ọ ga-akwụghachi ihe ndị a niile nʼuju, tụkwasịkwa otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ihe ahụ, nyeghachi ya onye nwe ya, nʼụbọchị ahụ ọ ga-eweta aja ikpe ọmụma ya.
LEV 6:6 Ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼihu Onyenwe anyị, aja ikpe ọmụma ya nke bụ ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ya ga-abụ ihe ahụ e gbubiri iji ịkwụ ụgwọ mmehie.
LEV 6:7 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, a ga-agbaghakwara ha nʼihi ihe ọbụla ha mere nke ikpe ji maa ha.”
LEV 6:8 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
LEV 6:9 “Nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom iwu sị: ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ. Aja nsure ọkụ ga-adịgide nʼekwu ahụ dị nʼebe ịchụ aja site nʼabalị ruo nʼụtụtụ. A ga-akwanyekwa ọkụ na-adị nʼebe ịchụ aja hapụ ya ka o nwuo abalị niile.
LEV 6:10 Mgbe chi bọrọ, onye nchụaja ga-eyiri uwe ime ahụ ya nke akwa ọcha, nakwa uwe elu ahụ ya, gaa kpopu ntụ dị nʼekwu nke ebe ịchụ aja nsure ọkụ ahụ, wụsa ha nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.
LEV 6:11 Mgbe o mesịrị nke a, ọ ga-agbanwe uwe ya, kporo ntụ ahụ, buru ya pụọ nʼazụ ogige ahụ gaa wufuo ya nʼebe ahụ e mere ka ọ dị ọcha.
LEV 6:12 Ọkụ dị nʼebe ịchụ aja ga na-enwu mgbe niile, a gaghị ekwe ka ọ nyụọ. Nʼụtụtụ niile onye nchụaja ga-akwanye ya nkụ ọhụrụ, tụkwasịkwa aja nsure ọkụ nʼelu ya surekwaa abụba aja udo nʼelu ya.
LEV 6:13 Ọkụ ga-enwugide nʼebe ịchụ aja mgbe niile. A gaghị ekwe ka ọ nyụọ mgbe ọbụla.’
LEV 6:14 “ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara onyinye mkpụrụ ọka. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-eguzo nʼihu ebe ịchụ aja iche ya nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 6:15 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-ekpoju ọka ahụ a kwọrọ nke ọma, na ụfọdụ mmanụ oliv, tinyere ụda na-esi isi ụtọ nʼaka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ nọchie anya onyinye ahụ niile, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma.
LEV 6:16 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri nke fọdụrụnụ. Ma a ga-eri ya na-ejighị ihe na-eko achịcha, nʼime ebe nsọ, nʼogige ụlọ nzute ka a ga-anọ eri ya.
LEV 6:17 Agaghị etinye ya ihe na-eko achịcha ma a na-eghe ya. Enyela ya ka ọ bụrụ oke ruuru ha site nʼonyinye nsure ọkụ e chere nʼihu m. Ha bụkwa ihe dịkarịsịrị nsọ, dịka aja ikpe ọmụma na aja mmehie.
LEV 6:18 Nwoke ọbụla sitere nʼagbụrụ Erọn, onye nchụaja, nwere ike iri ya. Ọ bụ oke ọ ga na-eketa site nʼonyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị ruo nʼọgbọ niile na-abịa. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-aghọ ihe dị nsọ.’ ”
LEV 6:19 Onyenwe anyị gwakwara Mosis sị,
LEV 6:20 “Nke a bụ aja Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-achụrụ Onyenwe anyị nʼụbọchị a ga-ete ya mmanụ. Ọ ga-abụ ọtụtụ ruru lita abụọ nke ọka dị ezi mma dịka aja onyinye a na-achụ mgbe niile. Ha ga-enye otu ọkara ya nʼụtụtụ, nye nke ọzọ nʼuhuruchi.
LEV 6:21 Ha ga-etinye ya mmanụ, ghee ya nʼite. Ị ga-ebubata ya mgbe a gwọkọrọ ya nke ọma, chee ya dịka aja ọka a nyawasịrị anyawasị nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma.
LEV 6:22 Nwa nwoke ahụ nke ga-anọchi ya dịka onye nchụaja e tere mmanụ bụ onye ga-akwado ya. Ọ bụ oke ruuru Onyenwe anyị ebighị ebi, bụrụkwa nke a ga-esure ọkụ kpamkpam.
LEV 6:23 Onyinye mkpụrụ ọka ọbụla nke onye nchụaja nyere ka a ga-akpọ ọkụ kpamkpam. A gaghị eri ya eri.”
LEV 6:24 Onyenwe anyị sịrị Mosis,
LEV 6:25 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom, sị, ‘Ndị a bụ usoro iwu unu ga-edebe banyere aja mmehie. A ga-egbu anụ aja mmehie nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
LEV 6:26 Onye nchụaja chụrụ ya ga-eri anụ ya, ọ bụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, ya bụ nʼogige ụlọ nzute ahụ ka a ga-anọ rie ya.
LEV 6:27 Ihe ọbụla metụrụ anụ nke ọbụla aka, ga-aghọ ihe dị nsọ. Ọ bụrụkwa na ọbara ya efesa nʼuwe ọbụla, ị ga-asụ uwe ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ.
LEV 6:28 A ghaghị itiwa ite aja e ji sie anụ ahụ. Ọ bụrụkwanụ nʼite bronz ka e siri ya, a ga-asa ite ahụ mmiri nke ọma, saa ya ka ọ dị ezi ọcha.
LEV 6:29 Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ ahụ, ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
LEV 6:30 Ma a gaghị eri anụ aja mmehie ọbụla, bụ nke e webatara ọbara ya nʼime ụlọ nzute maka ikpuchi mmehie nʼEbe nsọ ahụ. Aghaghị ịkpọ ya ọkụ.
LEV 7:1 “ ‘Ndị a bụ usoro iwu banyere aja ikpe ọmụma, bụ nke dịkarịsịrị nsọ.
LEV 7:2 A ga-egbu anụ aja ikpe ọmụma ahụ nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ, were ọbara ya fesaa nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
LEV 7:3 Abụba ya niile ka a ga-enye dịka onyinye: abụba dị nʼọdụdụ ya, na abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya,
LEV 7:4 na akụrụ abụọ ya, na abụba nke dị nʼelu ha, ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya.
LEV 7:5 Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. Ọ bụ aja ikpe ọmụma.
LEV 7:6 Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ fọdụrụ na ya, maọbụ nʼebe nsọ ka aghaghị ịnọ rie ya. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
LEV 7:7 “ ‘Otu iwu a metụtakwara aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Anụ ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ nke ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie. Oke ya ka ọ bụ.
LEV 7:8 Onye nchụaja nke chụrụ aja nsure ọkụ nʼisi onye ọbụla, ka ọ dịrị iwere akpụkpọ niile si nʼanụ ahụ o ji chụọ aja nye onwe ya.
LEV 7:9 A ga-ebunye onye nchụaja chụrụ aja mkpụrụ ọka nke e ji ụtụ ọka chụọ, ụtụ ọka fọdụrụ. Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼaja achịcha ọbụla a nụrụ anụ, maọbụ nke e siri esi, maọbụ nke e ghere eghe. Ihe ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ.
LEV 7:10 Aja mkpụrụ ọka ọbụla, ma nke e tinyere mmanụ, ma nke a na-etinyeghị mmanụ, nke fọdụrụ ga-abụ nke ụmụ ndị ikom Erọn.
LEV 7:11 “ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara aja udo nke mmadụ ọbụla nwere ike chụọrọ Onyenwe anyị nʼaja:
LEV 7:12 “ ‘Ọ bụrụ na ha enye ya dịka aja ekele, tinyere aja ekele a ha ga-eweta ogbe achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke a gwakọtara ya na mmanụ oliv, na mbadamba achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke e tere mmanụ nʼelu ya, nakwa achịcha e ji ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara ya na mmanụ nʼime ya.
LEV 7:13 Ọ ga-ewetakwa onyinye achịcha ọzọ nke e ji ihe na-eko achịcha, ya bụ, yiist mee, tinyere aja udo nke ekele ha.
LEV 7:14 Ha ga-esikwa na ya weta otu nʼime onyinye ọbụla, chee nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyinye. Ọ bụ nke ndị nchụaja ahụ na-efesa ọbara anụ e ji chụọ aja udo nʼelu ebe ịchụ aja.
LEV 7:15 Ma anụ ahụ eji chụọ aja onyinye udo nke ekele, ka a ga-eri nʼotu ụbọchị ahụ e ji ha chụọ aja. O nweghị nke a ga-ahapụ ka ọ bọọ chi.
LEV 7:16 “ ‘Ma ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ onyinye afọ ofufu, maọbụ onyinye o wetara nʼihi nkwa o kwere, a ga-eri anụ aja ahụ nʼụbọchị ahụ a chụrụ ya, nweekwa ike rie nke fọdụrụ ma chi bọọ.
LEV 7:17 Ma anụ ọbụla fọdụrụ nʼime anụ aja ahụ, nke a na-erichapụghị nʼụbọchị nke abụọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ.
LEV 7:18 Ọ bụrụ na e rie anụ aja udo ahụ nʼụbọchị nke atọ, a gaghị anabata ya. A gaghị agụnyere ya onye ahụ wetara ya nʼihi na ihe rụrụ arụ ka ọ bụ. Onye ọbụla riri ya ga-abụ onye ikpe mara.
LEV 7:19 “ ‘Anụ ọbụla nke metụrụ ihe rụrụ arụ aghọọla ihe na-adịghị ọcha. A gaghị eri ya. A ga-akpọ ya ọkụ. Ma nʼebe anụ ndị ọzọ dị, onye ọbụla e mere ka ọ dị ọcha nwere ike iri ya.
LEV 7:20 A ga-esite nʼetiti ndị m kewapụ onye ọbụla riri anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị mgbe onye ahụ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha.
LEV 7:21 Onye ọbụla metụrụ ihe ọbụla rụrụ arụ aka, ma ịrụ arụ ahụ o si na mmadụ, ma o si nʼanụ ọhịa, ma o si nʼihe ọbụla ọzọ, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya ma ọ bụrụ na onye ahụ anọrọ nʼọnọdụ ahụ rie anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị.’ ”
LEV 7:22 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 7:23 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Unu erila abụba ehi, maọbụ nke ewu, maọbụ nke atụrụ.
LEV 7:24 Abụba anụ ọbụla nwụrụ anwụ maọbụ nke anụ ọhịa gburu adịghị mma oriri. E nwere ike jiri ha mee ihe ọzọ.
LEV 7:25 A ga-ekewapụ mmadụ ọbụla site nʼetiti ndị ya, bụ onye na-eri abụba anụmanụ nke a ga-esite na ya chee onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
LEV 7:26 Ọzọkwa, unu erila ọbara nnụnụ maọbụ nke anụmanụ nʼebe ọbụla unu bi.
LEV 7:27 Onye ọbụla riri ọbara ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.’ ”
LEV 7:28 Onyenwe anyị gwakwara Mosis sị,
LEV 7:29 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla wetaara Onyenwe anyị onyinye aja udo aghaghị iweta ụfọdụ nʼime onyinye ahụ dịka onyinye pụrụ iche nye Onyenwe anyị.
LEV 7:30 Ha ga-eji aka ha chee onyinye nsure ọkụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-eweta abụba ahụ, ya na obi anụ, fufee obi anụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
LEV 7:31 Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja, ma obi anụ ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị ikom.
LEV 7:32 Unu ga-enye onye nchụaja apata aka nri nke anụ aja udo ahụ, dịka onyinye.
LEV 7:33 Nwa Erọn, onye ji ọbara na abụba chụọ aja udo ahụ ga-ewere apata aka nri ya dịka oke ruuru ya.
LEV 7:34 Site nʼonyinye ụmụ Izrel na-enye nʼoge aja udo, ewerela m obi anụ ahụ a na-efufe efufe, na apata anụ a na-eche nʼihu m nye Erọn, onye nchụaja na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ oke ruuru ha mgbe ọbụla ụmụ Izrel na-achụ aja udo.’ ”
LEV 7:35 Nke a bụ akụkụ anụ ahụ e ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke e nyekwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼụbọchị ahụ e chere ha nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi dịka ndị nchụaja.
LEV 7:36 Nʼihi na nʼụbọchị ahụ e tere ha mmanụ ka Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel iwu sị ha nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom oke ndị a oge niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
LEV 7:37 Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na aja mmehie, na aja ikpe ọmụma, na onyinye ido nsọ, na aja udo.
LEV 7:38 Onyenwe anyị nyere Mosis iwu ndị a nʼugwu Saịnaị nʼụbọchị ahụ o nyere ụmụ Izrel iwu sị ha, wetara Onyenwe anyị onyinye nʼọzara Saịnaị.
LEV 8:1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 8:2 “Kpọta Erọn na ụmụ ya ndị ikom, chịtakwa uwe ha, weta mmanụ nsọ, oke ehi nke aja mmehie na ebule abụọ ahụ, na nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
LEV 8:3 Kpọkọtaa ọgbakọ ụmụ Izrel niile ka ha bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.”
LEV 8:4 Mosis mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọgbakọ ụmụ Izrel zukọtara nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
LEV 8:5 Mosis gwara ọgbakọ ahụ sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka e mee.”
LEV 8:6 Mgbe ahụ, Mosis kpọpụtara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼihu, jiri mmiri saa ha ahụ.
LEV 8:7 O yikwasịrị Erọn uwe ime ahụ, kee ya ihe okike a na-eke nʼukwu, yikwasịkwa ya uwe mwụda na efọọd ahụ, jiri ihe okike ahụ a chọrọ mma kegidesie efọọd ahụ ike nʼahụ ya.
LEV 8:8 O tụkwasịrị ya ihe igbochi obi ahụ nʼahụ, tinye Urim na Tumim nʼime ihe igbochi obi ahụ.
LEV 8:9 Ọ tụhịkwara akwa ike nʼisi ahụ nʼisi Erọn, tinye nʼihu akwa ike nʼisi ahụ, okpu nsọ e ji ọlaedo kpụọ, nke bụ akara ido nsọ, dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.
LEV 8:10 Mgbe ahụ, Mosis weere mmanụ nsọ ahụ tee nʼụlọ nzute ahụ, na nʼihe niile dị nʼime ya, ido ha nsọ.
LEV 8:11 Ọ fesakwara ụfọdụ nʼime mmanụ ahụ ugboro asaa nʼebe ịchụ aja, fesakwa ya ugboro asaa nʼelu ngwongwo niile dị nʼebe ịchụ aja, na nʼefere e ji asa ihe, na ụkwụ ya, ido ha nsọ.
LEV 8:12 Ọ wụsara Erọn ụfọdụ mmanụ nsọ ahụ nʼisi, tee ya mmanụ, nʼihi ido ya nsọ.
LEV 8:13 Ọ kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, o yikwasịrị ha uwe ime ahụ, kee ha ihe okike nke ukwu, kekwasị ha ihe okike nʼisi, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
LEV 8:14 Ọ kpụtara oke ehi e ji achụ aja mmehie, mee ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya.
LEV 8:15 Mosis gburu oke ehi ahụ, were ụfọdụ nʼime ọbara ahụ, jiri mkpịsịaka ya rụta ọbara tee na mpi niile dị nʼebe ịchụ aja, ido ebe ịchụ aja ahụ nsọ. Ọ wụpụrụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja ahụ. Otu a ka o si doo ya nsọ, ikpuchiri ya mmehie.
LEV 8:16 Mosis wekwara abụba niile dị gburugburu ihe dị nʼime afọ ehi ahụ, mba-umeju nke umeju ya, akụrụ abụọ ya na abụba dị nʼelu ha, kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja.
LEV 8:17 Ma oke ehi ahụ, akpụkpọ ya, anụ ya na mgbịrị afọ ya, ka ọ kpọrọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
LEV 8:18 O weere ebule ahụ, chee nʼihu Onyenwe anyị, dịka aja nsure ọkụ. Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya.
LEV 8:19 Mgbe ahụ, Mosis gburu ebule ahụ, fesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
LEV 8:20 Ọ bọwasịrị ebule ahụ ntakịrị ntakịrị, kpọọ isi ya, iberibe anụ ya na abụba ya ọkụ.
LEV 8:21 Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya na ụkwụ ya niile mmiri, kpọọ ebule ahụ niile ọkụ nʼebe ịchụ aja. Nʼihi na ọ bụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma, nʼihi na ọ bụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
LEV 8:22 O kpụpụtara ebule nke ọzọ, bụ ebule nke ido nsọ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya.
LEV 8:23 Mgbe ahụ, Mosis gburu ya, were ụfọdụ nʼime ọbara ya tee Erọn nʼọnụ ntị aka nri, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
LEV 8:24 Mosis kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, weere ụfọdụ ọbara ahụ tee nʼọnụ ntị aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ha. O fesakwara ọbara nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
LEV 8:25 O weere abụba ya, akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba niile nke kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba ha, na apata aka nri ya
LEV 8:26 O sitere na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke dị nʼihu Onyenwe anyị, wepụta otu ogbe achịcha, na otu ogbe achịcha a gwakọtara mmanụ oliv, na otu mbadamba ogbe achịcha, tụkwasị ha nʼelu abụba ndị ahụ, na nʼelu apata aka nri ahụ.
LEV 8:27 O tinyere ihe ndị a niile nʼaka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ha fufere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
LEV 8:28 Mosis naara ya site nʼaka ha, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja, ya na aja nsure ọkụ, ka ọ bụrụ aja ido nsọ nke isisi ya dị ezi mma, onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
LEV 8:29 Mosis werekwara obi ebule ido nsọ ahụ, fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, dịka aja mfufe, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Nke a bụ oke Mosis.
LEV 8:30 Mgbe ahụ, Mosis weere ụfọdụ nʼime mmanụ nsọ ahụ, na ụfọdụ nʼime ọbara ahụ dị nʼebe ịchụ aja fesa ya Erọn na uwe ya, fesakwa ya ụmụ ndị ikom Erọn nʼuwe ha. Otu a ka o si doo Erọn na uwe ya, na ụmụ ya ndị ikom na uwe ha nsọ.
LEV 8:31 Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, “Sienụ anụ ahụ nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Nọrọkwanụ nʼebe ahụ rie ya na achịcha ahụ dị nʼime nkata onyinye ido nsọ, dịka a gwara m, sị, ‘Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri ya.’
LEV 8:32 Ihe ọbụla fọdụrụ na anụ ahụ na achịcha ahụ, ka unu ga-akpọ ọkụ.”
LEV 8:33 Ọ sịrị ha: “Unu esikwala nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute a pụọ ruo ụbọchị asaa, tutu ruo mgbe ụbọchị ido nsọ unu zuruoke, nʼihi na ido nsọ unu ga-anọ ụbọchị asaa.
LEV 8:34 Ihe niile e mere nʼụbọchị taa bụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, banyere ịchụ aja maka mkpuchi mmehie unu.”
LEV 8:35 Unu aghaghị ịnọgide nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ehihie na abalị ụbọchị asaa, mezuokwa ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, ka unu ghara ịnwụ. Nʼihi na nke a bụ iwu e nyere m.
LEV 8:36 Ya mere, Erọn na ụmụ ya ndị ikom mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye nʼiwu site nʼọnụ Mosis.
LEV 9:1 Nʼụbọchị nke asatọ, Mosis kpọrọ Erọn na ụmụ ya ndị ikom, na ndị okenye Izrel.
LEV 9:2 Ọ gwara Erọn sị, “Site nʼime igwe ehi were nwa oke ehi ị ga-eji chụọ aja mmehie. Werekwa ebule na-enweghị ntụpọ ị ga-eji chụọ aja nsure ọkụ, nke m ga-eche nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 9:3 Ọ gwakwara ụmụ Izrel sị ha, ‘Họrọnụ mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie, na nwa ehi, na nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ, ndị gbara naanị otu afọ, a ga-eji chụọ aja nsure ọkụ,
LEV 9:4 na ehi, na ebule a ga-eji chụọ aja udo nʼihu Onyenwe anyị, tinyere mkpụrụ ọka a gwara mmanụ. Nʼihi na taa ka Onyenwe anyị ga-eme ka unu hụ ya anya.’ ”
LEV 9:5 Ha wetara ihe ndị a niile bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute dịka Mosis nyere nʼiwu. Ọgbakọ ụmụ Izrel niile bịara nso guzo nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 9:6 Mgbe ahụ, Mosis sịrị ha, “Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị nyere unu nʼiwu idebe, ka ebube ya si otu a pụta ìhè nʼihu unu.”
LEV 9:7 Mosis sịrị Erọn, “Bịa nso nʼebe ịchụ aja. Chụọ aja mmehie, na aja nsure ọkụ nke a ga-eji kpuchie mmehie gị na mmehie ndị ahụ niile. Chụọ aja onyinye dịrị ndị ahụ, maka ikpuchiri ha mmehie ha, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
LEV 9:8 Erọn bịara nso nʼebe ịchụ aja, gbuo nwa ehi ahụ ka ọ bụrụ aja mmehie nke ya.
LEV 9:9 Ụmụ Erọn buteere ya ọbara ehi ahụ. O tinyere mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja. Ọ wụrụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja ahụ.
LEV 9:10 Ọ kpọrọ abụba ya, na akụrụ ya abụọ, na ihe kpuchiri umeju si nʼaja mmehie ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka Onyenwe anyị nyere Mosis iwu.
LEV 9:11 Ma anụ ahụ ya, na akpụkpọ ya, ka ọ kpọrọ ọkụ nʼazụ ebe obibi.
LEV 9:12 Emesịa, o gburu anụ e wetara maka aja nsure ọkụ ahụ. Ụmụ ya ndị ikom nyere ya ọbara anụ ahụ, nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja.
LEV 9:13 Ha nyefere ya aja nsure ọkụ ahụ nʼaka nʼotu ha sị bọọ ya, tinyere isi ya. Ọ kpọrọ ihe niile ọkụ nʼebe ịchụ aja.
LEV 9:14 Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, kpọọ ha ọkụ, dịka aja nsure ọkụ.
LEV 9:15 Emesịa, Erọn wetara onyinye nke dị maka ndị mmadụ, o were ewu ahụ bụ maka mmehie ndị mmadụ, gbuo ya, were chụọ aja mmehie, dịka o mere nke mbụ.
LEV 9:16 Ọ chụkwara aja nsure ọkụ nʼusoro dịka iwu e nyere si dị.
LEV 9:17 O webatakwara aja mkpụrụ ọka ahụ, kporo nke juru ya aka, kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja, tinyekwara aja nsure ọkụ nke ụtụtụ ahụ.
LEV 9:18 Nʼikpeazụ, o gburu ehi na ebule ahụ, nke bụ aja udo ndị Izrel. Ụmụ Erọn buteere ya ọbara nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja.
LEV 9:19 Ọ chịkọtara abụba niile dị ehi na ebule ndị ahụ nʼahụ, na ọdụdụ ha, na abụba kpuchiri ihe ime ha, ya na akụrụ ha, na abụba kpuchiri umeju ha,
LEV 9:20 tụkwasị ha nʼobi anụ ndị ahụ, kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja.
LEV 9:21 Mgbe ahụ, Erọn fufere, dịka onyinye mfufe, obi anụ ahụ, na apata aka nri ha nʼihu Onyenwe anyị dịka Mosis nyere nʼiwu.
LEV 9:22 Erọn weliri aka ya elu nʼebe ụmụ Izrel nọ, gọzie ha. Emesịa, mgbe ọ chụchara aja mmehie, na aja nsure ọkụ na aja udo, o sitere nʼebe ịchụ aja ahụ rịdata.
LEV 9:23 Mosis na Erọn bara nʼime ụlọ nzute. Mgbe ha pụtara, ha gọziri ọha mmadụ ahụ. Mgbe ahụ kwa, ebube Onyenwe anyị pụtara ìhè nye mmadụ niile nʼọgbakọ ahụ.
LEV 9:24 Ọkụ sitekwara nʼebe Onyenwe anyị nọ daa, rechapụ aja nsure ọkụ ahụ, na abụba ahụ dị nʼebe ịchụ aja. Mgbe ndị Izrel hụrụ ya, ha tiri mkpu ọṅụ. Daa, kpuo ihu nʼala.
LEV 10:1 Ma ụmụ Erọn, Nadab na Abihu, were ọkụ tinye nʼihe ịgụ ọkụ ha, tinyekwa ụda na-esi isi nʼọkụ ahụ, si otu a chee ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼụzọ megidere ihe e nyere nʼiwu.
LEV 10:2 Nʼihi ya, ọkụ sitere nʼihu Onyenwe anyị daa rechapụ ha, ha nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 10:3 Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị bu nʼobi mgbe o kwuru sị, “ ‘Nʼetiti ndị niile na-abịaru m nso ka a ga-edo m nsọ ọ bụkwa nʼihu ọha mmadụ, ka a ga-asọpụrụ m.’ ” Ma Erọn gbara nkịtị.
LEV 10:4 Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Mishael na Elzafan, ụmụ Uziel, nwanne nna Erọn sị ha, “Bịanụ nso. Gaanụ buputa ozu ụmụnne unu site nʼihu ebe nsọ, buru ha gaa nʼazụ ebe obibi.”
LEV 10:5 Ha bịara ghanye aka nʼuwe ime ahụ ha buru ha bupụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, dịka Mosis nyere nʼiwu.
LEV 10:6 Mosis tụgharịrị sị Erọn na ụmụ ya, Elieza na Itama, “Unu ekwekwala ka ntutu isi unu kpasaa akpasa izipụta na unu na-eru ụjụ. Unu adọwakwala uwe unu. Nʼihi na ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-anwụ. Iwe Onyenwe anyị ga-abịakwasịkwa ọgbakọ Izrel niile. Ma ndị ikwu gị, ụmụ Izrel ndị ọzọ, nwere ike ruo ụjụ nʼihi Nadab na Abihu.
LEV 10:7 Ọzọ, unu ahapụla ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka unu ghara ịnwụ, nʼihi na mmanụ nsọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ unu.” Ha mere dịka Mosis gwara ha.
LEV 10:8 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Erọn sị,
LEV 10:9 “Gị na ụmụ gị ndị ikom agaghị aṅụ mmanya, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya mgbe unu na-aba nʼụlọ nzute ka unu ghara ịnwụ. Agbụrụ unu niile ga-esogide iwu a ruo ọgbọ niile na-abịa.
LEV 10:10 Ọrụ unu ka ọ bụ ịkpa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ, na nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha.
LEV 10:11 Ọrụ unu bụkwa izi ụmụ Izrel ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼaka Mosis.”
LEV 10:12 Mosis sịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom fọdụrụ, bụ Elieza na Itama, “Werenụ onyinye mkpụrụ ọka nke fọdụrụ site na onyinye nsure ọkụ, nke a kwadoro na-etinyeghị ihe iko achịcha ọbụla, bụ nke e nyere Onyenwe anyị. Rienụ ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja, nʼihi na ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
LEV 10:13 Rienụ ya nʼime ebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke ruru unu na ụmụ unu ndị ikom site nʼonyinye nsure ọkụ e nyere Onyenwe anyị; nʼihi na nke a bụ ihe e nyere m nʼiwu.
LEV 10:14 Ma unu na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom ka ọ dịkwara iri obi anụ na apata ya, nke e fufere nʼihu Onyenwe anyị. Kama, ọ bụ nʼebe dị ọcha ka unu ga-anọ rie ya. Nke a bụ oke enyere unu na ụmụ unu site nʼaja udo nke ụmụ Izrel.
LEV 10:15 Apata ụkwụ anụ nke aja mbuli na obi anụ ahụ nke e fufere, ka a ga-eweta ya na abụba ya nye dịka onyinye sitere nʼọkụ. A ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Nke a ga-abụ oke ruuru unu na ụmụ unu mgbe niile, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
LEV 10:16 Mgbe Mosis jụrụ ajụjụ banyere mkpi ahụ e ji chụọ aja mmehie, ọ chọpụtara na a kpọọla ya ọkụ. O wesoro Elieza na Itama ụmụ ndị ikom Erọn iwe sị ha,
LEV 10:17 “Gịnị mere unu erighị anụ ahụ e ji chụọ aja mmehie nʼakụkụ ebe nsọ ahụ? Ọ bụ nke dịkarịsịrị nsọ; e nyere unu ya maka iwepụ ọmụma ikpe dịrị ọgbakọ Izrel, na ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 10:18 Ebe ọ bụ na e webataghị ọbara ya nʼime Ebe Nsọ ahụ, unu gaara anọ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ rie anụ ewu ahụ, dịka m nyere unu nʼiwu.”
LEV 10:19 Ma Erọn zara Mosis sị ya, “Lee, taa ka ha chụrụ aja mmehie na aja nsure ọkụ ha nʼihu Onyenwe anyị. Ma lee ụdị ihe dakwasịrị m. Ọ gaara atọ Onyenwe anyị ụtọ ma a sị na m riri anụ aja mmehie ndị a nʼụbọchị dị otu a?”
LEV 10:20 Mgbe Mosis nụrụ nke a, o nwere afọ ojuju nʼihi ọsịsa Erọn nyere.
LEV 11:1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn, sị,
LEV 11:2 “Gwanụ ụmụ Izrel, sị, ‘Nʼime anụmanụ niile dị nʼụwa, ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri.
LEV 11:3 Unu nwere ike iri anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa. nke na-atagharị ọnụ.
LEV 11:4 “ ‘Ma ọ dị ụfọdụ ndị na-atagharị nri maọbụ ndị nwere naanị ụkwụ wara njakpa, unu agaghị eri anụ ha. Ha bụ ịnyịnya kamel, ọ bụ ezie na ọ na-atagharị nri, ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Unu agaghị eri ha nʼihi na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha.
LEV 11:5 Ewi: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
LEV 11:6 Ewi nkume: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
LEV 11:7 Ezi: Ọ bụ nʼezie na ụkwụ ya wara njakpa ma ọ dịghị atagharị nri ya. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
LEV 11:8 Unu emetụkwala ozu ha aka maọbụ rie anụ ha, nʼihi na ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.
LEV 11:9 “ ‘Nʼime ihe niile e kere eke dị ndụ biri na mmiri, maọbụ nʼiyi nta na nʼoke osimiri, unu nwere ike iri ụdị ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha.
LEV 11:10 Ma unu ekwesighị iri ihe ọbụla nke na-enweghị ntu maọbụ akpịrịkpa, ma ha bụ anụ na-enupụta enupụta, maọbụ na ha so nʼanụ ndị ọzọ dị ndụ bi na mmiri, unu kwesiri ịsọ ha asọ.
LEV 11:11 Ebe ha bụ ihe na-asọ oyi nye unu, unu ekwesighị iri ha, unu ga-agụkwa ozu ha ka ihe na-adịghị ọcha.
LEV 11:12 Ihe ọbụla bi nʼime mmiri nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha, bụ nke unu ga-asọ asọ.
LEV 11:13 “ ‘Ndị a bụ nnụnụ ndị unu ga-asọ asọ, nke unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha bụ ihe arụ a na-asọ oyi: ugo, udele na udele ojii,
LEV 11:14 ndagbụ na ọgankwọ dị iche iche,
LEV 11:15 ugolọma ọbụla dị iche iche,
LEV 11:16 enyi nnụnụ, egbe abalị, nnụnụ oke osimiri na egbe dị iche iche,
LEV 11:17 okwukwu nta, komorant na okwukwu ukwu,
LEV 11:18 okwukwu nwere mpi, okwolo na udele,
LEV 11:19 ụgbala, utù dị iche iche, nnụnụ ọdụ nta na ụsụ.
LEV 11:20 “ ‘Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ bụ ihe rụrụ arụ nye unu, unu agaghị eri ya.
LEV 11:21 Ma e nwere ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ ndị unu nwere ike iri: ndị a bụ ndị nwere ogwe ụkwụ nke ha ji na-awụ awụ nʼala,
LEV 11:22 ndị a ka unu ga-eri nʼetiti ha, igurube dị iche iche, na akpankwụ dị iche iche, na abụzụ dị iche iche, na ụkpana dị iche iche.
LEV 11:23 Ahụhụ ndị ọzọ niile na-efe efe, ndị nwere ụkwụ anọ, bụ ihe rụrụ arụ. Unu ekwesighị iri ha.
LEV 11:24 “ ‘Iri ha ga-eme ka unu rụọ arụọ. Onye ọbụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ site nʼoge o bitụrụ ha aka tutu ruo nʼabalị nke ụbọchị ahụ.
LEV 11:25 Onye ọbụla metụrụ otu nʼime ozu ha aka ga-asakwa uwe ya, gụọkwa onwe ya dịka onye na-adịghị ọcha ruo uhuruchi.
LEV 11:26 “ ‘Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya na-awasaghị abụọ, maọbụ nke na-adịghị atagharị nri ya ugboro abụọ, rụrụ arụ. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
LEV 11:27 Nʼime anụmanụ niile na-aga ije nʼụkwụ anọ, anụmanụ ọbụla na-aga ije nʼọbụaka ya rụrụ arụ, unu agaghị eri ya. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
LEV 11:28 Onye ọbụla ga-ebu ozu ya ga-asa uwe ya, bụrụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi, nʼihi na ọ bụ ihe rụrụ arụ nʼebe unu nọ.
LEV 11:29 “ ‘Nʼime anụmanụ niile na-enupụta enupụta nʼala, anụmanụ ndị a bụ ndị rụrụ arụ: nkapi, na oke, na agụ iyi dịka ụdị ha si dị,
LEV 11:30 na ọba mmiri, na ngwere aghụ, na ngwere, na ngwere uzuzu, na ogumagala.
LEV 11:31 Nʼime ihe niile na-enupụta enupụta nʼala ndị a rụrụ arụ nʼebe unu nọ. Onye metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ tutu ruo uhuruchi ụbọchị ahụ.
LEV 11:32 Ihe ọbụla nke ozu ha dakwasịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ, maọbụ osisi, maọbụ akwa, maọbụ akpụkpọ a na-akwa nʼala, maọbụ akpa, ihe ọbụla nke eji ya eme. A ga-etinye ya na mmiri, ọ ga-adịgide nʼime mmiri tutu ruo uhuruchi, mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha.
LEV 11:33 Ọ bụrụ na otu nʼime ihe ndị a adanye nʼite aja, a ga-etiwa ite ahụ. Ihe niile dị nʼite ahụ abụrụla ihe rụrụ arụ.
LEV 11:34 Ihe oriri ọbụla nke mmiri si nʼite a metụrụ abụrụla ihe rụrụ arụ. Mmiri ọṅụṅụ ọbụla dị nʼime ite ahụ rụkwara arụ.
LEV 11:35 Ihe ọbụla ozu anụmanụ dị otu a dakwasịrị, maọbụ ite ọkụ eji eghe ihe, maọbụ ekwu a ga-etiwa ha. Nʼihi na ha bụ ihe rụrụ arụ, unu ga-agụ ha dịka ihe rụrụ arụ.
LEV 11:36 Ọ bụrụkwa na ozu anụmanụ ahụ adaba nʼisi iyi, maọbụ nʼolulu mmiri, mmiri ahụ ga-adị ọcha, kama onye ga-emetụ anụ ahụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
LEV 11:37 Ọ bụrụ na ozu anụ ahụ adakwasị mkpụrụ ubi a na-aga ịkụ nʼubi, ọ gaghị emerụ ha.
LEV 11:38 Ma ọ bụrụ na e tinyere mmiri nʼelu mkpụrụ ọghịgha ndị ahụ, ozu adakwasị nʼelu ya, ha ga-abụ ihe rụrụ arụ.
LEV 11:39 “ ‘Ọ bụrụ na anụmanụ unu kwesiri iri eri anwụọ, onye ahụ metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
LEV 11:40 Onye ọbụla riri ozu anụ ahụ, maọbụ bufuo ozu ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya mmiri.
LEV 11:41 “ ‘Anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala bụ ihe rụrụ arụ nye unu. Unu erikwala ha.
LEV 11:42 Unu agaghị eri anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala, ma ha na-akpụgharị nʼafọ ha, ma ha na-agagharị nʼụkwụ anọ, ma ha nwere ụkwụ dị ọtụtụ. Ha bụ ihe rụrụ arụ.
LEV 11:43 Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala. Unu abụla ndị na-emerụ onwe unu site nʼanụmanụ ndị a, maọbụ mee ka unu bụrụ ndị e merụrụ site na ha.
LEV 11:44 Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu. Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na adị m nsọ. Unu emerụla onwe unu site nʼimetụ anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala aka.
LEV 11:45 Abụ m Onyenwe anyị, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu, ka m bụrụ Chineke unu. Unu aghaghị ịdị nsọ, nʼihi na adị m nsọ.
LEV 11:46 “ ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara ụmụ anụmanụ, na anụ ufe, na anụ bi na mmiri, na anụ ndị na-arịgharị arịgharị nʼala.
LEV 11:47 Ka unu si otu a kpaa oke nʼetiti ndị rụrụ arụ na ndị dị ọcha, nʼetiti ihe e kere eke dị ndụ ndị unu nwere ike iri nʼihi na ha dị ọcha, na ndị unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha rụrụ arụ.’ ”
LEV 12:1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya,
LEV 12:2 “Nye ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha, ‘Mgbe nwanyị tụụrụ ime mesịa mụọ nwa nwoke, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa, dịka o si adị mgbe ọ nọ nʼadịghị ọcha nke nsọ ya nʼoge a kara aka.
LEV 12:3 Nʼụbọchị nke asatọ site nʼoge a mụrụ ya, a ga-ebi nwa nwoke ahụ ugwu.
LEV 12:4 Nʼime iri abalị atọ na atọ site nʼụbọchị nwanyị ahụ mụsịrị nwa ahụ, ọ ga-anọkwa na-adịghị ọcha nke ọbara gbara ya. Ọ gaghị emetụ ihe dị nsọ aka, maọbụ banye nʼime ebe nsọ, ruo mgbe ụbọchị ime ya ka ọ dị ọcha gasịrị.
LEV 12:5 Mgbe nwanyị dị ime mụrụ nwa nwanyị, ọ ga-abụ onye nʼadịghị ọcha iri ụbọchị na anọ, dịka o si adị mgbe ọ nọ na nsọ ya. Ọ ga-echere tutu iri ụbọchị isii agwụsịa, ime ya ka ọ dị ọcha.
LEV 12:6 “ ‘Mgbe ụbọchị ịdị ọcha ya zuru, ma ọ mụrụ nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị, ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute otu nwa atụrụ gbara otu afọ maka onyinye aja nsure ọkụ, na otu nwa kpalakwukwu maọbụ otu nduru maka onyinye aja mmehie.
LEV 12:7 Onye nchụaja ga-anarakwa ha chee ha nʼihu Onyenwe anyị, chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie. Mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha site nʼịsọ ọbara ya. “ ‘Nke a bụ usoro iwu dịịrị nwanyị ọbụla mụrụ nwa nwoke, maọbụ nwa nwanyị.
LEV 12:8 Ọ bụrụ na aka erughị ya iweta nwa atụrụ, ọ ga-eweta ụmụ kpalakwukwu abụọ, maọbụ ụmụ nduru abụọ. Otu ga-abụ maka aja nsure ọkụ, nke ọzọ ga-abụ maka aja mmehie. Onye nchụaja ga-ewere ha chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie, ka ọ dịkwa ọcha ọzọ.’ ”
LEV 13:1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
LEV 13:2 “Mgbe mmadụ hụrụ etuto, maọbụ ọnya, maọbụ ntụpọ na-eko eko nʼakpụkpọ anụ ahụ ya nke dị ka ihe ọrịa ekpenta na-eweta, a ga-eduru onye ahụ bịa nʼihu Erọn onye nchụaja maọbụ ụmụ ya ndị ikom, bụ ndị nchụaja.
LEV 13:3 Onye nchụaja ga-eleru ọrịa ahụ dị ya nʼahụ anya. Ọ bụrụ na ajị dị gburugburu ebe ahụ ebidola ịcha ọcha, ọ bụrụkwa na ebe ahụ mibara ime, ọ bụ ọrịa ekpenta. Mgbe onye nchụaja leruchara ya anya, ọ ga-ekwupụta na onye ahụ bụ onye rụrụ arụ.
LEV 13:4 Ọ bụrụkwanụ na ajị dị gburugburu ebe ahụ dị ọcha, ma na ebe ahụ emighị emi karịa akụkụ ahụ ya ndị ọzọ, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ebe ọ ga-anọ naanị ya abalị asaa.
LEV 13:5 Mgbe ụbọchị asaa gasịrị, onye nchụaja ga-ele ya ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ọnya ahụ alabeghị, na ọ nwekwaghị mgbanwe ọbụla, a ga-edebekwa ya abalị asaa ọzọ.
LEV 13:6 Mgbe abalị asaa nke a gafekwara, onye nchụaja ga-elekwa ya ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ọ dịtụla ya mma, na ọnya ahụ agbasaghị nʼanụ ahụ ya, onye nchụaja ga-asị na ọ dị ọcha, nʼihi na ọ bụ naanị ọnya efu. Onye ahụ ga-asakwa uwe ya mmiri, mgbe ahụ dị ọcha.
LEV 13:7 Ma ọ bụrụ na ọnya ahụ agbasaa nʼahụ ya mgbe o gosicharala onye nchụaja onwe ya maka nsacha ịdị ọcha, ọ ga-alaghachikwa azụ ga hụ onye nchụaja ahụ ọzọ.
LEV 13:8 Onye nchụaja ga-eleru ya anya, ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ọnya ahụ na-agbasa, ọ ga-agụ onye ahụ dịka onye rụrụ arụ, ọ bụ ọrịa na-efe efe.
LEV 13:9 “Mgbe ọbụla mmadụ nwere ihe dị ka ọrịa na-efe efe nʼahụ ya, a ghaghị ịkpọtara ya onye nchụaja.
LEV 13:10 Onye nchụaja ga-ele anya nʼakụkụ anụ ahụ ya zara aza ịchọpụta ma ọ dị ọcha, ma ajị dị gburugburu ebe ahụ ọ na-acha ọcha, na ịhụkwa ma ọ nwere ọnya dị gburugburu ebe ahụ.
LEV 13:11 Ọ bụrụ na onye nchụaja ahụ ihe ndị a, ọ bụ ọrịa ekpenta nʼezie. Ọ ga-agụkwa onye ahụ dịka onye rụrụ arụ. A gaghị edebekwa ya ile ya ahụ, nʼihi na ọ bụrụlarị onye rụrụ arụ.
LEV 13:12 “Ọ bụrụ na onye nchụaja elee onye ahụ anya hụ na ọrịa ọcha ahụ enupụtala nʼakụkụ ahụ ya niile, site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya,
LEV 13:13 onye nchụaja a ga-eleru ya anya, ọ bụrụ na ọrịa ahụ enupụtala nʼahụ ya niile, ọ ga-ekwupụta na onye ahụ dị ọcha, ebe ọ bụ na ọrịa ahụ enupụtala mee ka anụ ahụ ya chawa ọcha.
LEV 13:14 Ma ọ bụrụ na e nwere akụkụ ahụ ya ọnya ọ hụrụ pụtara, ọ ga-agụ ya dịka onye na-adịghị ọcha.
LEV 13:15 Onye nchụaja ga-enyocha ọnya ahụ. Kwupụta na onye ahụ rụrụ arụ. Ọnya ahụ rụrụ arụ nʼihi na ọrịa ekpenta ka ọ bụ.
LEV 13:16 Ọ bụrụ nʼọnya ahụ agbanwe na-acha ọcha, ha ga-agakwuru onye nchụaja.
LEV 13:17 Onye nchụaja ga-ele ya ahụ. Ọ bụrụ na ọnya niile ahụ na-acha ezi ọcha, onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye na-enweghị ntụpọ. Ndị dị ọcha ka ha ga-abụ.
LEV 13:18 “Ọ bụrụ na etuto toro mmadụ nʼahụ alaa,
LEV 13:19 ma akpụkpọ anụ ahụ ya anọgide na-acha ọcha, maọbụ na-acha ọbara ọbara, a ga-ejekwuru onye nchụaja ka o lee ya anya nʼahụ.
LEV 13:20 Ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na e nwere ọrịa dị nʼokpuru akpụkpọ ahụ ya, chọpụtakwa na ajị ya na-acha ọcha, onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye rụrụ arụ, nʼihi na ekpenta esitela nʼetuto ahụ pụta.
LEV 13:21 Ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ajị ọcha adịghị nʼakpụkpọ ahụ ya, chọpụtakwa na ọnya ahụ abanyeghị nʼime, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa.
LEV 13:22 Nʼime ụbọchị asaa ahụ, ọ bụrụ na ọnya ahụ abaa ụba karịa ka ọ dị na mbụ, onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa na-emerụ emerụ ka ọ bụ.
LEV 13:23 Ma ọ bụrụ na ọ baghị ụba karịa, onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye dị ọcha, nʼihi na ihe a bụ etuto lara ala.
LEV 13:24 “Ọ bụrụ na ọkụ agbaa mmadụ, mee ka ọnya pụta ya nʼahụ: ọ bụrụ na ọnya ahụ ebido na-acha ọbara ọbara, maọbụ na-acha ezigbo ọcha,
LEV 13:25 onye nchụaja ga-elezi onye dị otu a anya. Ọ bụrụ na ajị dị gburugburu ebe ọnya ahụ dị na-acha ọcha, maọbụ na ọnya ahụ mibara ime karịa, ọ ghọọla ekpenta nke si nʼọnya ahụ nupụta. Onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa ekpenta.
LEV 13:26 Ma ọ bụrụ na onye nchụaja elee ya hụ na ajị dị gburugburu ebe ahụ adịghị ọcha, ọ bụrụkwa na ọ dịghị ala karịa akpụkpọ ahụ, na ọ na-aṅacha, mgbe ahụ onye nchụaja ga-edebe onye ahụ iche ụbọchị asaa.
LEV 13:27 Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-elezi onye ahụ anya nke ọma. Ọ bụrụ na ọ chọpụtara na ọnya ahụ na-abasaa nʼakpụkpọ ahụ ya, onye nchụaja ga-agụ onye ahụ dịka onye na-adịghị ọcha. Ọrịa na-emerụ emerụ ka ọ bụ.
LEV 13:28 Ma ọ bụrụ na ọ gbanweghị, bụrụkwa na ọ basaghị nʼakpụkpọ ahụ ma ọ na-aṅacha, ọ bụ ihe ọzịza sitere nʼọkụ rere onye ahụ, onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye dị ọcha, nʼihi na ọ bụ apa ọnya lara ala.
LEV 13:29 “Ọ bụrụ na nwoke maọbụ nwanyị ọbụla enwee ọnya nʼisi, maọbụ na nti ya,
LEV 13:30 onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọ dị ala karịa akpụkpọ ahụ ya, ọ bụrụkwa na ajị dị na ya na-acha odo odo dị irighiri, onye nchụaja ga-agụ ha dịka ndị na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa na-emerụ emerụ nke dị nʼisi maọbụ nʼagba.
LEV 13:31 Ma ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ọnya ahụ adịghị abasa abasa, maọbụ na ajị dị nʼebe ahụ adịghị eji ojii, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa.
LEV 13:32 Nʼụbọchị nke asaa onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọnya ahụ abasaghị karịa, ọ bụrụ na o nweghị ajị na-acha edo edo, ọ bụrụkwa na o mibaghị emiba,
LEV 13:33 ọ ga-akpụchapụ ajị niile dị nʼakụkụ ebe ahụ ọnya mere ya, ma ọ gaghị akpụchapụ ajị dị nʼọnya ahụ nʼonwe ya. Onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa.
LEV 13:34 Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọ basaghị karịa, maọbụ mibanye nʼime karịa anụ ahụ, a ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye dị ọcha. Ọ ga-apụ sachaa uwe ya, bụrụ onye dị ọcha.
LEV 13:35 Ma ọ bụrụ na mgbe a gụchara ya nʼonye dị ọcha ọnya ahụ emesịa basaa nʼahụ ya.
LEV 13:36 Onye nchụaja ga-ele ya anya. Ọ bụrụ na ọnya ahụ agbasaala nʼakpụkpọ ahụ ya, onye nchụaja a gaghị achọwa ajị na-acha edo edo. Onye ahụ rụrụ arụ.
LEV 13:37 Ma ọ bụrụ nʼuche onye nchụaja na ọnya ahụ adịghị abasa abasa, ọ bụrụkwa na ajị ojii epupụtala nʼebe ahụ, ọnya ahụ alaala. Onye dị ọcha ka mmadụ ahụ bụ. Onye nchụaja ga-ekwupụta na ọ dị ọcha.
LEV 13:38 “Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ọbụla nwere ntụpọ ọcha nʼanụ ahụ ya,
LEV 13:39 onye nchụaja ga-ele ya ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ adịghị achazi ezi ọcha, ọ bụ ọkọ nupụtara onye ahụ nʼahụ. Onye ahụ dị ọcha.
LEV 13:40 “Mgbe ajị na-adịghịkwa nwoke nʼisi, ọ bụ isi nkwọcha, onye ahụ dị ọcha.
LEV 13:41 Otu aka ahụ, ọ bụrụ na isi ya esite nʼegedege ihu ya kwọchasịa, ọ bụghị ekpenta, onye dị ọcha ka ọ bụ.
LEV 13:42 Kama ọ bụrụ na onye ahụ enwee etuto nʼisi ya maọbụ nʼegedege ihu ya nke na-acha ọbara ọbara, na ọcha ọcha, o nwere ike bụrụ ọrịa ekpenta na-enupụta ya nʼisi maọbụ nʼegedege ihu.
LEV 13:43 Nʼihi ya, onye nchụaja ga-elezi ya anya. Ọ bụrụ na etuto ahụ toro ya nʼisi maọbụ nʼegedege ihu na-acha ọbara ọbara, na ọcha ọcha, ọ ga-abụ na ọ ghọọla ọrịa ekpenta.
LEV 13:44 Onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye ekpenta. Ọ bụkwa onye rụrụ arụ, nʼihi ọnya ahụ dị ya nʼisi.
LEV 13:45 “Onye ọbụla a chọpụtara na ọ bụ onye ekpenta ga-eyi uwe dọkara adọka, hapụ agịrị isi ya ka ọ dịka nke onye ara. Ọ ga-ekpuchi elu egbugbere ọnụ ya, na-eti mkpu na-asị, ‘Onye rụrụ arụ ka m bụ. Onye rụrụ arụ ka m bụ!’
LEV 13:46 Ụbọchị niile nke ọ nọ nʼọrịa ahụ, ọ gaghị ebi nʼime obodo nʼetiti ụmụ mmadụ nʼihi na onye rụrụ arụ ka ọ bụ.
LEV 13:47 “Ọ bụrụ na a hụrụ ntụpọ yiri ntụpọ ọrịa na-efe efe nʼuwe ajị anụ maọbụ nʼuwe ogho ọcha,
LEV 13:48 maọbụ nʼakpụkpọ anụ ọbụla, maọbụ nʼihe ọbụla e ji akpụkpọ ajị anụ maọbụ uwe ogho ọcha, uwe a kpara akpa, maọbụ nke a tụrụ atụ mee.
LEV 13:49 Ọ bụrụkwa na ntụpọ dị nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakpụkpọ anụ ahụ, maọbụ nke a kpara akpa, maọbụ nke atụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ ọbụla na-acha ahịhịa ndụ maọbụ uhie uhie, o nwere ike ịbụ ọrịa na-efe efe. A ga-ewegara onye nchụaja uwe ahụ ka o lezie ya anya.
LEV 13:50 Onye nchụaja ga-ele ya anya, were ya debe ya iche ụbọchị asaa.
LEV 13:51 Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-ele ya anya ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaa nʼuwe ahụ maọbụ nʼihe ahụ a kpara akpa, maọbụ nʼihe ahụ a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ ahụ, nʼime ụbọchị asaa ndị a, nʼagbanyeghị ihe e ji ha eme, ọ bụ ọrịa ọjọọ na-efe efe. Ihe ahụ bụ ihe rụrụ arụ.
LEV 13:52 A ga-akpọ uwe ahụ, maọbụ akwa ajị anụ ahụ, maọbụ akwa ajị anụ a kpara akpa, maọbụ akwa ogho ọcha ahụ, maọbụ ihe akpụkpọ anụ ọbụla ọkụ, nʼihi na ọrịa na-efe efe dị nʼime ya, nʼihi na ọrịa na-eweta mbibi ka ọ bụ. A ghakwaghị iji ọkụ rechapụ ya.
LEV 13:53 “Ma ọ bụrụ na onye nchụaja ahụ ele hụ na ntụpọ ahụ agbasaghị nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakwa ahụ a kpara akpa, maọbụ akwa a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ ahụ ọbụla.
LEV 13:54 Ọ ga-enye iwu ka a saa ihe ndị ahụ niile mmiri, wezugakwa ya iche ruo ụbọchị asaa ọzọ.
LEV 13:55 Mgbe a sachara ihe ahụ mmiri, onye nchụaja ga-ele ya anya ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbanwebeghị, ọ bụrụ na ọ na-achakwa dịka o si acha na mbụ, mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, ọ bụ ezie na ọ gbasaghị, ọ bụ ihe rụrụ arụ. A ga-akpọ ya ọkụ, ma ntụpọ ahụ ọ dị nʼihu uwe ahụ maọbụ nʼazụ ya.
LEV 13:56 Ma ọ bụrụ na onye nchụaja elee ya anya hụ na ụcha ntụpọ dị nʼihe ahụ adịghị ukwuu nʼihi nsacha a sachara ya na mmiri, ọ ga-achakapụ akụkụ uwe ahụ, maọbụ akwa ahụ a kpara akpa maọbụ nke a tụrụ atụ.
LEV 13:57 Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ emesịa pụta ọzọ nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakwa ahụ a kpara akpa, maọbụ nke a tụrụ atụ, maọbụ nʼakpụkpọ anụ ahụ, o gosiri na ọ na-agbasa agbasa. Ihe ọbụla nwere ntụpọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ.
LEV 13:58 Uwe maọbụ ihe a kpara akpa, maọbụ ihe a tụrụ atụ, maọbụ ihe akpụkpọ anụ ọbụla a sara mmiri nke ntụpọ dị na ya pụrụ, a ga-asa ya mmiri ọzọ. Ọ ga-abụkwa ihe dị ọcha.”
LEV 13:59 Ndị a bụ usoro iwu metụtara ntụpọ dịka ntụpọ ọrịa na-efe efe nke dị nʼuwe ajị anụ maọbụ uwe ogho ọcha, maọbụ nʼihe a kpara akpa maọbụ nʼihe a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ. Iwu ndị a ga-enye aka ịchọpụta ma ha rụrụ arụ, maọbụ na ha dị ọcha.
LEV 14:1 Onyenwe anyị gwara Mosis, sị,
LEV 14:2 “Ndị a bụ usoro iwu gbasara onye ọrịa ekpenta nʼoge a na-eme mmemme ịdị ọcha ya, mgbe e dutere ya bịakwute onye nchụaja.
LEV 14:3 Onye nchụaja ga-apụ gaa nʼazụ ebe obibi nọdụ nʼebe ahụ lee ya ahụ, ịchọpụta ma ọrịa ekpenta ya ọ laala nʼezie. Ọ bụrụ na ọrịa ya alaala,
LEV 14:4 onye nchụaja ga-enye iwu ka e weta nnụnụ abụọ dị ndụ, na ụfọdụ osisi sida, na eriri ogho uhie, na hisọp, maka onye ahụ a ga-emere mmemme ịdị ọcha.
LEV 14:5 Onye nchụaja ga-enye iwu ka e gbuo otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ nʼelu mmiri e si nʼọdọ mmiri na-asọ asọ kute nke dị nʼime ite aja.
LEV 14:6 Ọ ga-ewere nnụnụ nke ọzọ dị ndụ, ya na osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na hisọp ahụ, denye ha nʼime ọbara nnụnụ ahụ e gburu nʼelu mmiri ahụ.
LEV 14:7 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-efe ọbara ahụ ugboro asaa nʼahụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha site nʼọrịa ekpenta. Ọ ga-ekwupụtakwa na a gwọọla onye ahụ. Emesịa, ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ ka o felaa nʼọhịa.
LEV 14:8 “Onye ahụ e mere ka ọ dị ọcha ga-asacha uwe ya, kpụchaa ntutu isi ya, saakwa ahụ ya. Mgbe ahụ, ọ ga-adị ọcha. Emesịa, ọ ga-esoro ndị mmadụ biri nʼobodo. Ma ọ gaghị abanye nʼụlọ nke aka ya tutu ụbọchị asaa agafee.
LEV 14:9 Nʼụbọchị nke asaa, ọ ga-akpụchapụ ntutu isi ya, na afụọnụ ya, na ikuanya ya, na ajị ndị ọzọ dị ya nʼahụ. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya niile. Mgbe ahụ, a ga-agụ ya nʼonye dị ọcha.
LEV 14:10 “Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere ebule abụọ na-enweghị ntụpọ, na otu nne atụrụ nke na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ, ya na iri iko ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara mmanụ oliv maka aja mkpụrụ ọka, na otu iko mmanụ.
LEV 14:11 Onye nchụaja ahụ lere ya ahụ sị na ha dị ọcha, ga-ewere aja ndị a, ha na onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha chee nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
LEV 14:12 “Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ụmụ ebule ahụ, na otu iko mmanụ chụọ ya dịka onyinye aja ikpe ọmụma. Ọ ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
LEV 14:13 Ọ ga-egbu nwa ebule ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, nʼebe a na-anọ egbu anụ aja mmehie na aja nsure ọkụ. Ọ bụ onye nchụaja ga-ewere anụ aja ikpe ọmụma a, dịka o were nke aja mmehie. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
LEV 14:14 Onye nchụaja ahụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara aja ikpe ọmụma ahụ, tee nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Ọ ga-etekwa ya nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼelu isi mkpụrụ ụkwụ nke ụkwụ aka nri ya.
LEV 14:15 Emesịa onye nchụaja ga-awụnyetụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,
LEV 14:16 ọ ga-arụnye otu mkpịsịaka nri ya nʼime mmanụ dị nʼọbụaka ya, ọ ga-ewere mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ nʼime ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 14:17 Onye nchụaja ga-ewere mmanụ ahụ fọdụrụ nʼọbụaka ya tee ya onye ahụ nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya, nʼelu ọbara aja ikpe ọmụma ahụ mee.
LEV 14:18 Ọ ga-ete mmanụ ahụ fọdụrụ nʼaka ya, nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 14:19 “Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-achụ aja mmehie, kpuchiere onye ahụ a ga-eme ka ọ dị ọcha site na-adịghị ọcha ha mmehie ya. Emesịa, onye nchụaja ga-egbu aja nsure ọkụ ahụ,
LEV 14:20 were ya na onyinye mkpụrụ ọka chụọrọ onye ahụ aja, maka ikpuchiri ya mmehie ya. Mgbe ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dị ọcha.
LEV 14:21 “Ọ bụrụ na ọ bụ ogbenye onye na-enweghị ike iweta ihe ndị a, ha aghaghị iwere otu nwa ebule dịka aja ikpe ọmụma nke a ga-efufe nʼihi aja ikpuchi mmehie ha, Ọ ga-ewetakwa iko ọka a kwọrọ nke ọma asaa maọbụ ihe ọtụtụ efaa a gwara mmanụ oliv dịka aja mkpụrụ ọka, ya na otu iko mmanụ.
LEV 14:22 Ọ ga-ewetakwa nduru abụọ maọbụ kpalakwukwu abụọ, nke ọbụla o nwere ike iweta. Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ.
LEV 14:23 “Ọ ga-ewere ha nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute nʼihu Onyenwe anyị, nʼụbọchị nke asatọ ya, maka ime ka ha dị ọcha.
LEV 14:24 Onye nchụaja ga-ewerekwa nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, ya na otu iko mmanụ oliv ahụ, fufee ha nʼihu ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị.
LEV 14:25 Ọ ga-egbu nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, were ụfọdụ ọbara ya tee nʼọnụ ntị aka nri onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
LEV 14:26 Onye nchụaja ahụ ga-awụnye ụfọdụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,
LEV 14:27 ọ ga-ewere mkpịsịaka nri ya fesa ụfọdụ mmanụ ahụ nke dị nʼọbụaka ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 14:28 Ọ ga-etekwa ụfọdụ mmanụ ahụ dị nʼaka ya nʼebe ndị ahụ o tere ọbara ikpe ọmụma ahụ, nke bụ nʼọnụ ntị onye ahụ nke a na-eme ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
LEV 14:29 Mmanụ nke fọdụrụ nʼaka ya ka onye nchụaja ga-ete nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha, ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 14:30 Emesịa, ọ ga-eji nduru abụọ ahụ maọbụ kpalakwukwu abụọ ahụ, nke ọbụla o nwere ike iweta, chụọ aja.
LEV 14:31 Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ, ha na aja mkpụrụ ọka. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, bụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha.”
LEV 14:32 Ndị a bụ usoro iwu dịrị onye ọbụla e sitere nʼọrịa ekpenta mee ka ọ dị ọcha, onye aka ya na-erughị iweta ihe o kwesiri iweta, bụ nke e ji eme ka ọ dị ọcha.
LEV 14:33 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
LEV 14:34 “Mgbe unu banyere ala Kenan, bụ ala ahụ m na-enye unu, ọ bụrụ na o nwee ụlọ ọbụla m webatara ọrịa na-efe efe,
LEV 14:35 onyenwe ụlọ ahụ ga-ejekwuru onye nchụaja sị ya, ‘Ahụla m ihe yiri ọrịa na-efe efe nʼụlọ m.’
LEV 14:36 Onye nchụaja ahụ ga-enye iwu ka a kwapụsịa ihe niile dị nʼụlọ ahụ tupu ọ gaa lezie ụlọ ahụ anya, ka ihe niile dị nʼụlọ ahụ ghara ịbụ ihe rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na achọpụta ọrịa na-efe efe nʼụlọ ahụ. Mgbe a kwapụtasịrị ihe dị nʼụlọ ahụ, onye nchụaja ga-aga lee ụlọ ahụ.
LEV 14:37 Ọ ga-ele ntụpọ dị nʼahụ ụlọ ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ, maọbụ ọbara ọbara, ọ bụrụkwa na ha miri emi karịa aja ụlọ ahụ nʼile anya,
LEV 14:38 onye nchụaja ga-esi nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ pụọ, kpọchie ụlọ ahụ ụbọchị asaa.
LEV 14:39 Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-alọghachi bịa lee ụlọ ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaala nʼaja ụlọ ahụ,
LEV 14:40 onye nchụaja ga-enye iwu ka e tida akụkụ aja ụlọ ahụ bufuo ya nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
LEV 14:41 Ọ ga-enyekwa iwu ka a kpụchaa aja ụlọ niile dị nʼime ụlọ ahụ, bufukwaa aja niile a kpụchapụtara nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
LEV 14:42 A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ.
LEV 14:43 “Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ apụta ọzọ, mgbe e bupụsịrị nkume ndị ahụ, ma mgbe a kpuchasịrị aja ụlọ ma techikwaa ya,
LEV 14:44 onye nchụaja ga-abịa lee ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na ntụpọ ahụ agbasaala ọzọ, ọ ga-agụ ụlọ ahụ dịka ihe rụrụ arụ, nʼihi na ntụpọ ahụ bụ ọrịa na-efe efe.
LEV 14:45 Ọ ga-enye iwu ka a kwatuo ụlọ ahụ bufukwaa ihe niile e jiri rụọ ya, nkume niile, osisi niile na ụrọ niile, nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
LEV 14:46 “Onye ọbụla banyere nʼụlọ ahụ nʼoge e mechiri ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo nʼoge uhuruchi.
LEV 14:47 Onye ọbụla dinara ala maọbụ rie nri nʼime ya, ga-asacha uwe ya.
LEV 14:48 “Ma ọ bụrụ na onye nchụaja abịa hụ na ntụpọ ahụ apụtaghị ọzọ, mgbe e techara ụlọ ahụ ụrọ nke ugboro abụọ, ọ ga-agụ ya nʼụlọ dị ọcha, nʼihi na ọrịa ahụ na-efe efe alaala.
LEV 14:49 Ọ ga-ejikwa nnụnụ abụọ, na osisi sida, na ogho uhie, na osisi hisọp mee mmemme ido ihe ọcha.
LEV 14:50 Ọ ga-egbu otu nʼime nnụnụ ndị ahụ nʼelu mmiri e si nʼiyi na-asọ asọ kute, nke dị nʼime ite aja.
LEV 14:51 Ọ ga-edenye osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na osisi hisọp ahụ, nʼime ọbara nnụnụ ahụ na mmiri ahụ. Ọ ga-efesa ọbara ahụ nʼụlọ ahụ ugboro asaa.
LEV 14:52 Ọ bụ ọbara nnụnụ ahụ, na mmiri ahụ, na nnụnụ nke ọzọ ahụ dị ndụ, na osisi sida ahụ na hisọp ahụ, na ogho uhie ahụ ka ọ ga-eji mee ka ụlọ ahụ dị ọcha.
LEV 14:53 Ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ dị ndụ ka o fepụ felaa nʼọhịa dị nʼazụ obodo. Nke a ga-abụ otu e si kpuchiere ụlọ ahụ mmehie ya. Ọ ga-adịkwa ọcha.”
LEV 14:54 Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta, na ọkọ,
LEV 14:55 na ọrịa na-efe efe dị nʼuwe maọbụ nʼụlọ,
LEV 14:56 maọbụ etuto, maọbụ ntụpọ, maọbụ ọnya.
LEV 14:57 Iwu ndị a ga-enye aka ịmata ihe rụrụ arụ maọbụ ihe na-adịghị ọcha. Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta na ọrịa na-efe efe.
LEV 15:1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
LEV 15:2 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nwoke ọbụla ihe nsọpụta si nʼahụ ya na-asọpụta, bụ onye rụrụ arụ.
LEV 15:3 Onye ahụ rụrụ arụ mgbe ihe ahụ si ya nʼahụ na-asọpụta, rụọkwa arụ mgbe ihe ahụ kwụsịrị ịsọ. Otu a ka ihe ọsụsọ ahụ si eme ka onye ahụ rụọ arụ.
LEV 15:4 “ ‘Ihe ọbụla onye ahụ ji anọdụ ala, maọbụ nke o ji dinaa bụ ihe rụrụ arụ.
LEV 15:5 Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya, na ahụ ya mmiri.
LEV 15:6 Onye ọbụla nọdụrụ ala nʼihe onye ahụ nọdụrụ ala nʼoge ahụ ọ bụ onye rụrụ arụ, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya, na ahụ ya mmiri.
LEV 15:7 “ ‘Onye ọbụla metụrụ nwoke ahụ ihe si nʼahụ ya na-asọpụta aka ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri, bụrụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
LEV 15:8 “ ‘Onye ọbụla dị ọcha nke onye ahụ bụsara ọnụ mmiri ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.
LEV 15:9 “ ‘Ihe ọbụla onye ahụ ji anọkwasị nʼelu anụmanụ ọ na-agba ga-abụ ihe rụrụ arụ.
LEV 15:10 Onye ọbụla ga-eburu, maọbụ metụ ihe ọbụla o ji nọdụ ala aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.
LEV 15:11 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ahụ rụrụ arụ ebughị ụzọ saa aka ya tupu o metụ mmadụ aka, onye ahụ o metụrụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.
LEV 15:12 “ ‘A ga-etiwa ite aja ọbụla onye ahụ metụrụ aka, jiri mmiri ṅachaa ihe osisi ọbụla o metụrụ aka.
LEV 15:13 “ ‘Mgbe e mere ka onye ahụ bụrụ onye dị ọcha site nʼihe nsọpụta a, ọ ga-anọ ụbọchị asaa maka ịdị ọcha ya. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya nʼime mmiri na-asọ asọ tupu ọ bụrụ onye dị ọcha.
LEV 15:14 Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ bịa nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, were ha nye onye nchụaja.
LEV 15:15 Onye nchụaja ga-eji ha chụọrọ ya aja nʼebe ahụ. Otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ maka aja nsure ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri nwoke ahụ mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị nʼihi ihe ọsụsọ ahụ.
LEV 15:16 “ ‘Nwoke ọbụla mkpụrụ nwa ya si ya nʼamụ pụọ, ga-asa ahụ ya nke ọma, bụrụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
LEV 15:17 A ga-asacha ihe ọbụla mkpụrụ nwa ahụ metụrụ, maọbụ akwa maọbụ akpụkpọ anụ. Ha ga-abụ ihe rụrụ arụ ruo uhuruchi.
LEV 15:18 Mgbe nwoke na nwanyị dinakọrọ, ma nwoke ahụ anyụpụta mkpụrụ nwa, ha abụọ ga-asa ahụ ha nke ọma, bụrụ ndị rụrụ arụ ruo uhuruchi.
LEV 15:19 “ ‘Mgbe ọbara si nwanyị nʼahụ pụọ dịka o kwesiri nʼoge a kara aka nʼọnwa ọbụla, nwanyị ahụ ga-abụ onye rụrụ arụ ụbọchị asaa. Onye ọbụla metụrụ ya aka nʼoge a ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
LEV 15:20 “ ‘Ihe ọbụla o dinara nʼelu ya nʼoge a, maọbụ ihe ọ nọkwasịrị nʼelu ya ga-arụ arụ.
LEV 15:21 Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya aka, ga-asa uwe ya na ahụ ya. Ọ ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
LEV 15:22 Onye metụrụ ihe o ji nọdụ ala aka ga-asa uwe ya na ahụ ya. Ọ ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
LEV 15:23 Ọ bụrụkwa na ọ bụ ihe ndina ya, maọbụ ihe ọzọ nke o ji nọdụ ala, onye ọbụla metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
LEV 15:24 “ ‘Nwoke dinakwuru nwanyị ọbara si nʼahụ ya na-apụta, ọ bụrụ na ọbara ahụ emetụ ya, ọ ga-abụ onye rụrụ arụ abalị asaa. Ihe ndina ọbụla o dinara nʼelu ya ga-abụ ihe rụrụ arụ.
LEV 15:25 “ ‘Ọ bụrụ na ọbara si nwanyị nʼahụ na-apụta agafee oge o kwesiri ịkwụsị maọbụ na ọ pụtara nʼoge ọ na-ekwesighị ịpụta, nwanyị ahụ ga-anọgide bụrụ onye rụrụ arụ ogologo ụbọchị ndị ahụ niile ọbara ahụ si ya nʼahụ na-apụta.
LEV 15:26 Ihe ọbụla o dinara nʼelu ya mgbe ọbara si ya nʼahụ na-apụta, maọbụ ihe ọbụla ọ nọdụrụ ala nʼelu ya, ga-abụ ihe rụrụ arụ, dịka mgbe ọbara nke oge a kara aka.
LEV 15:27 Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya maọbụ ihe ọ nọdụrụ ala nʼelu ya aka, ga-arụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asakwa uwe ya na ahụ ya mmiri.
LEV 15:28 “ ‘Mgbe ọbara ahụ kwụsịrị, ọ ga-agụ ụbọchị asaa site nʼoge ọ kwụsịrị. Mgbe abalị asaa ahụ zuru, ọ ga-abụ onye dị ọcha.
LEV 15:29 Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
LEV 15:30 Onye nchụaja ahụ ga-eji otu chụọrọ ya aja mmehie, werekwa nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi adịghị ọcha nke ihe ọsụsọ ya.
LEV 15:31 “ ‘Unu ga-ekewapụ ụmụ Izrel site nʼihe ndị ahụ na-emerụ ha, ka ha ghara ịnwụ nʼọnọdụ adịghị ọcha ha nʼihi imerụ ụlọ nzute m, nke dị nʼetiti ha.’ ”
LEV 15:32 Ndị a bụ usoro iwu gbasara ndị ikom ihe si nʼahụ ha na-asọpụta, na ndị ikom rụrụ arụ nʼihi mkpụrụ nwa si ha nʼahụ pụọ.
LEV 15:33 Ọ bụkwa iwu dịrị nwanyị ọbara si nʼahụ ya pụọ nʼoge a kara aka, na nwoke maọbụ nwanyị ọbụla ihe si nʼahụ ya na-asọpụta, na nke dịrị nwoke ọbụla ya na nwanyị ga-edinakọ nʼoge nwanyị ahụ bụ onye rụrụ arụ.
LEV 16:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu mgbe ụmụ ndị ikom Erọn abụọ ndị ahụ bịara nʼihu Onyenwe anyị nwụsịrị.
LEV 16:2 Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Gwa nwanne gị nwoke Erọn si ya ka ọ ghara ịbata mgbe ọbụla ọ chọrọ, nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ nke dị nʼazụ akwa mgbochi, nke dị nʼihu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-anwụ. Nʼihi na aga m apụta ìhè nʼime igwe ojii dị nʼelu ebe mkpuchi ahụ.
LEV 16:3 “Otu a ka Erọn ga-esi na-abata nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ. Ọ ga-eweta nwa oke ehi nʼihi aja mmehie, na ebule ọ ga-eji chụọ aja nsure ọkụ,
LEV 16:4 Ọ ga-eyikwasị onwe ya uwe mwụda ọcha, ya na uwe ime ahụ dị ọcha. Ọ ga-eke gburugburu ukwu ya ihe ike nʼukwu akwa ọcha, keekwa akwa ọcha nʼisi ya. Ndị a bụ uwe dị nsọ, nʼihi ya, ọ ga-ebu ụzọ saa ahụ tupu ọ na-eyi ha.
LEV 16:5 Ọ ga-esi nʼaka ọgbakọ ụmụ Izrel nata mkpi abụọ nʼihi aja mmehie, na otu ebule nʼihi aja nsure ọkụ.
LEV 16:6 “Erọn ga-eweta oke ehi nke ya, maka aja mmehie iji kpuchie mmehie nke ya na nke ezinaụlọ ya.
LEV 16:7 Emesịa, ọ ga-ewere mkpi abụọ ndị ahụ chee ha nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
LEV 16:8 Ọ ga-efe nza nʼisi mkpi abụọ ahụ, ịchọpụta nke dịrị Onyenwe anyị nke ọzọ abụrụ nke ọ ga-ahapụ.
LEV 16:9 Mkpi ahụ nza mara ga-abụ nke Onyenwe anyị, ya ka Erọn ga-egbu dịka aja mmehie.
LEV 16:10 Ma mkpi ahụ nke nza mara dịka ewu na-ewere ọnọdụ iburu mmehie ka a ga-eche na ndụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi iji ya mee mmemme mkpuchi mmehie, a ga-ahapụ ya ka o buru mmehie niile kpafuo nʼọzara.
LEV 16:11 “Erọn ga-eweta oke ehi maka aja mmehie nke ya onwe ya, iji kpuchie mmehie ya na nke ezinaụlọ ya. Ọ ga-egbu oke ehi ahụ maka aja mmehie nke ya onwe ya.
LEV 16:12 Ọ ga-esite nʼebe ịchụ aja dị nʼihu Onyenwe anyị were ihe ịgụ ọkụ jupụtara nʼicheku ọkụ. Ọ ga-ewerekwa ụda na-esi isi ụtọ ruru mkpoju aka abụọ, were ha bata nʼime akụkụ nke ọzọ nke akwa mgbochi ahụ.
LEV 16:13 Nʼebe ahụ ọ ga-awụnye ụda ndị ahụ na-esi isi ụtọ nʼelu icheku ọkụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị, ka anwụrụ ọkụ nke ụda ndị a kpuchie ebe mkpuchi mmehie ahụ dị nʼelu Ihe Ama ahụ ka ọ ghara ịnwụ.
LEV 16:14 Ọ ga-ewebatakwa ụfọdụ ọbara oke ehi ahụ, jiri mkpịsịaka ya fesa ya nʼihu ebe mkpuchi mmehie ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, fesakwa ya ugboro asaa nʼihu ebe mkpuchi mmehie ahụ.
LEV 16:15 “Emesịa, ọ ga-esi nʼebe ahụ pụọ gaa gbuo mkpi aja mmehie ụmụ Izrel, werekwa ọbara ya bata nʼazụ akwa mgbochi fesa ya nʼelu ebe mkpuchi mmehie ahụ, na nʼihu ya, dịka o jiri ọbara nwa oke ehi ahụ mee.
LEV 16:16 Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri Ebe ahụ Kachasị Nsọ mmehie ya, nʼihi mmehie na nnupu isi ụmụ Izrel, ihe ọbụla mmehie ndị ahụ bụ. Ọ ga-achụkwa ụdị aja a nʼihi ụlọ nzute ahụ, nʼihi na ọ dị nʼetiti ebe obibi rụrụ arụ nke ụmụ Izrel.
LEV 16:17 O nweghị onye ọbụla ọzọ ga-anọ nʼime ụlọ nzute ahụ, site nʼoge Erọn banyere nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ ịchụ aja mkpuchi mmehie tutu ruo mgbe ọ pụtara, mgbe ọ chụchara aja mkpuchi mmehie maka onwe ya na ezinaụlọ ya, na maka ụmụ Izrel niile.
LEV 16:18 “Mgbe o si nʼebe ahụ pụta, gaa nʼebe ịchụ aja dị nʼihu Onyenwe anyị kpuchiere ya mmehie ya. Ọ ga-ewere ụfọdụ ọbara nwa oke ehi ahụ na nke mkpi ahụ tee ya na mpi niile dị nʼebe ịchụ aja ahụ.
LEV 16:19 Ọ ga-eji mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ ọbara ahụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ ugboro asaa iji hichapụ adịghị ọcha ya nʼihi ịrụ arụ ụmụ Izrel, na ido ya nsọ.
LEV 16:20 “Mgbe Erọn chụchara aja mkpuchi mmehie maka Ebe ahụ Kachasị Nsọ, ụlọ nzute, nakwa ebe ịchụ aja, ọ ga-akpụbata mkpi ahụ e debere ndụ.
LEV 16:21 Ọ ga-ebikwasị aka ya abụọ nʼisi ya, kwupụta ajọ omume na nnupu isi ụmụ Izrel niile, mmehie ha niile, bokwasị ha mkpi ahụ nʼisi. Ọ ga-ezipụ mkpi ahụ pụọ nʼime ọzara site nʼaka onye ahụ a họpụtara ime nke a.
LEV 16:22 Nʼụzọ dị otu a, mkpi ahụ ga-eburu mmehie ndị ahụ niile baa nʼebe mmadụ ọbụla na-ebighị. Nwoke ahụ ga-ahapụkwa ya nʼọzara.
LEV 16:23 “Mgbe ahụ, Erọn ga-aba nʼime ụlọ nzute ahụ, yipụ uwe akwa ọcha ndị nchụaja ahụ niile o yi nʼahụ ya tupu ọ banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ. Ọ ga-awụsa ha nʼebe ahụ.
LEV 16:24 Ọ ga-eji mmiri saa ahụ ya nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, yirikwa uwe efu ya. Mgbe ahụ, ọ ga-apụta bịa chụọ aja nsure ọkụ nke onwe ya, na aja nsure ọkụ nke ndị ahụ, maka ikpuchiri onwe ya, na ikpuchikwara ndị ahụ mmehie ha.
LEV 16:25 Ọ ga-akpọkwa abụba anụ e ji chụọ aja mmehie ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.
LEV 16:26 “Mgbe nwoke ahụ kpụgara mkpi ahụ nʼọzara hapụ ya, lọtara, ọ ga-asa ahụ ya na uwe ya tupu ọ laghachi nʼime obodo.
LEV 16:27 Oke ehi nakwa mkpi maka ịchụ aja mmehie ahụ, bụ nke ewebatara ọbara ha nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, maka ikpuchi mmehie, ka aghaghị ibupụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu; a ga-akpọ akpụkpọ ha, anụ ahụ ha na mgbịrị afọ ha niile ọkụ.
LEV 16:28 Onye ga-akpọ ha ọkụ ga-asa uwe ya, saakwa ahụ ya tupu ọ laghachi nʼime obodo.
LEV 16:29 “Nke a ga-abụrụ unu ụkpụrụ ebighị ebi. Nʼafọ ọbụla, unu ga-ebu ọnụ, hapụ ịrụ ọrụ ọbụla, nʼụbọchị iri nke ọnwa asaa. Iwu a dịrị nwa afọ ala maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu.
LEV 16:30 Nʼihi na nʼụbọchị a ka a na-ekpuchiri unu mmehie unu, ime ka unu dịrị ọcha. Mgbe ahụ, unu ga-abụ ndị dị ọcha site na mmehie unu niile nʼihu Onyenwe anyị.
LEV 16:31 Ọ bụ ụbọchị izuike nye unu, bụrụkwa ụbọchị unu ga-ebu ọnụ. Iwu a enweghị mgbanwe!
LEV 16:32 Onye nchụaja e tere mmanụ, nke e doro nsọ dịka onye nchụaja ịnọchi nna ya, ga-achụ aja mkpuchi mmehie ndị a, yirikwa akwa ọcha ahụ, bụ uwe nsọ ahụ.
LEV 16:33 Ọ ga-ekpuchiri Ebe ahụ Kachasị Nsọ na ụlọ nzute, ebe ịchụ aja na ndị nchụaja, na mkpokọta ndị obodo niile mmehie ha.
LEV 16:34 “Nke a ga-abụ iwu ebighị ebi nye unu. Otu ugboro nʼotu afọ ka a ga-ekpuchi mmehie maka mmehie ndị Izrel niile.” E mezuru ihe ndị a niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.
LEV 17:1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 17:2 “Gwa Erọn, na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
LEV 17:3 Onye ọbụla bụ onye ụlọ Izrel gbuo ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu nʼogige ebe obibi, maọbụ nʼazụ ebe obibi,
LEV 17:4 ma o wetaghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute iche ya dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị, a ga-agụ onye ahụ dịka onye ikpe iwufu ọbara mara. Ọ wụfuola ọbara, nʼihi ya, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya.
LEV 17:5 Ihe e ji nye iwu a bụ ka ụmụ Izrel wetara Onyenwe anyị aja niile ha na-achụ ugbu a na mbara ezi ọbụla. Ha kwesiri iwetara ya Onyenwe anyị site nʼaka onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka o jiri ya chụọrọ ha aja udo.
LEV 17:6 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-efesa ọbara ahụ nʼebe ịchụ aja dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, kpọọkwa abụba ya ọkụ, ka ọ bụrụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.
LEV 17:7 O kwesikwaghị ka ndị Izrel chụọ aja ha ọzọ na mbara ezi nye arụsị ewu ndị ha na-akpọ isiala nye. Iwu a ga-adịgide nye ha na ụmụ ha niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.’
LEV 17:8 “Gwa ha, ‘Onye Izrel ọbụla, maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu, nke ga-achụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ọzọ,
LEV 17:9 ma o webataghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebe a ga-achụrụ ya Onyenwe anyị, ka a ga-ewezuga site nʼetiti ndị ya.
LEV 17:10 “ ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti ha, nke riri ọbara ọbụla ka m ga-eche ihu m megide. A ga-ewezuga ya site nʼetiti ndị m.
LEV 17:11 Nʼihi na ndụ ihe nwere ndụ dị nʼọbara ya, ọ bụ nʼihi nke a ka m ji nye iwu na a ga-awụsa ọbara niile nʼelu ebe ịchụ aja, maka iji ya kpuchie mmehie unu. Ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie maka ndụ mmadụ.
LEV 17:12 Nʼihi nke a, a sịrị ndị Izrel, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu, maọbụ onye ọbịa ọbụla nke bi nʼetiti unu ga-eri ọbara.”
LEV 17:13 “ ‘Onye Izrel ọbụla, na onye ọbịa ọbụla binyere unu nke gara ịchụ nta, gbuo anụ maọbụ nnụnụ ọbụla a na-eri eri, ga-awụfu ọbara ya were aja kpuchie ya.
LEV 17:14 Nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara. Ọ bụ ya mere m ji nye ụmụ Izrel iwu si unu erila ọbara anụmanụ ọbụla, nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara ya. Nʼihi ya onye ọbụla riri ọbara, a ga-ekewapụ ya site nʼetiti ndị m.
LEV 17:15 “ ‘Mmadụ ọbụla, maọbụ nwa afọ ma ọ bụkwanụ onye ọbịa, nke riri anụ nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, ga-eji mmiri saa uwe ya na ahụ ya, ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi tupu ọ dị ọcha ọzọ.
LEV 17:16 Ma ọ bụrụ na ọ saghị uwe ya na ahụ ya, ikpe ọmụma dị ya nʼisi.’ ”
LEV 18:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
LEV 18:2 “Gwa ụmụ Izrel okwu ndị a sị ha, ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
LEV 18:3 Ya mere, ọ bụ ezie na unu ebiela nʼetiti ndị Ijipt, ma unu ekwesighị ibi ndụ unu dịka ha si ebi. Unu ekwesịkwaghị ibi ndụ dịka ndị Kenan ebe m na-akpọbata unu. Unu agbasola omenaala ha.
LEV 18:4 Unu ga-edebe iwu m niile, gbasookwa ụkpụrụ m niile nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
LEV 18:5 Debenụ iwu m na ụkpụrụ m, nʼihi na onye na-edebe ha ga-adị ndụ site na ha. Abụ m Onyenwe anyị.
LEV 18:6 “ ‘Onye ọbụla ya na mmadụ bụ nwanne e jekwurukwala ya ka ha nwe mmekọ edina, i ji kpughee ọtọ ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
LEV 18:7 “ ‘Ị gaghị eleda nna gị anya site na i jekwuru nne gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nne gị ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe ụdị mmekọ dị otu a.
LEV 18:8 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nke a bụ ileda nna gị anya.
LEV 18:9 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne gị nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, maọbụ nwa nwanyị nke a mụụrụ nna gị, maọbụ nwa nwanyị nke nne gị mụrụ, ma a mụrụ ya nʼụlọ ma a mụrụ nʼama.
LEV 18:10 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nke nwa gị nwoke mụrụ, maọbụ nwa nwanyị nke nwa gị nwanyị mụrụ i nwe mmekọ edina; nʼihi na nke a ga-eweta nleda anya nye gị.
LEV 18:11 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nwunye nna gị mụrụ, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọ bụ nwa nna gị mụrụ; nwanne gị nwanyị ka ọ bụ.
LEV 18:12 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nwanyị nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nna gị, ha bụ otu ahụ.
LEV 18:13 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nne gị nke nwanyị, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nne gị, ha bụ otu ahụ.
LEV 18:14 “ ‘Ị gaghị eleda nwanne nna gị nke nwoke anya, site nʼijekwuru nwunye ya, ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nʼihi na nwunye nwanna gị ka ọ bụ.
LEV 18:15 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwa gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina; nwunye nwa gị nwoke ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe mmekọrịta ọbụla gosiri mkpughe ọtọ ya.
LEV 18:16 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwanne gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na nke a bụ omume nleda anya nye nwanne gị nwoke.
LEV 18:17 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanyị na nwa ya nwanyị ka gị na ha nwe mmekọ edina. Ị gaghị akpọrọ nwa nwanyị nwa ya nwoke, maọbụ nwa nwanyị nke nwa ya nwanyị mụrụ dinaa ya; nʼihi na otu ọbara ka ha bụ. Ihe dị otu a bụ arụ.
LEV 18:18 “ ‘Ị gaghị alụ nwanne nwanyị nwunye gị, dịka nwunye ọzọ gị, nʼihi ịkpagbu ya, gị na ya a na-enwe mmekọrịta edina, ị na-ekpughe ọtọ nwunye gị mgbe ọ ka dị ndụ.
LEV 18:19 “ ‘E jekwurukwala nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, mgbe ọ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha nke (ịsọ ụba) nsọ nwanyị ya nʼoge a kara aka.
LEV 18:20 “ ‘A kpọrọkwala nwunye onye agbataobi gị idina ya, si otu a merụọ onwe gị nʼihi mmekọ dị otu a.
LEV 18:21 “ ‘Ị gaghị enye nwa gị ka e jiri ya chụọrọ Molek aja. Nʼihi na i kwesighị imerụ aha Chineke gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
LEV 18:22 “ ‘Gị na nwoke edinala, dịka nwanyị na nwoke si edina. Ihe akpọrọ asị ka ọ bụ.
LEV 18:23 “ ‘Gị na anụmanụ ọbụla edinakwala, site otu a merụọ onwe gị. Nwanyị agakwaghị ewere onwe ya nye ka ya na oke anụmanụ nwee mmekọrịta, arụ a na-adịghị eme eme ka ọ bụ.
LEV 18:24 “ ‘Unu emerụkwala onwe unu site na-ime ihe ndị a, nʼihi na ihe ndị a bụ ihe mba ndị ahụ na-eme. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ga-eji chụpụ ha site nʼala ahụ m ga-enye unu.
LEV 18:25 Ọ bụladị ala ahụ niile ghọrọ ihe rụrụ arụ site nʼomume ndị a. Ọ bụ nke a mere m ji ata ndị bi nʼime ya ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ala ahụ meghere ọnụ ya gbọpụta ndị bi nʼime ya.
LEV 18:26 Unu ga-edebe iwu m na ụkpụrụ m ndị a niile. Unu emekwala ihe arụ ndị a, ma ndị amụrụ nʼala ma ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu.
LEV 18:27 Ala m na-aga inye unu rụrụ arụ nʼihi na ndị bi nʼime ya na-eme omume ndị a rụrụ arụ.
LEV 18:28 Unu emekwala ihe arụ ndị a, nʼihi na ọ bụrụ na unu emee ha, ọ ga-emeghe ọnụ ya gbọpụta unu, dịka o si mee mba niile bụ ndị buru unu ụzọ biri nʼime ya.
LEV 18:29 “ ‘Onye ọbụla nʼetiti unu mere ihe arụ ndị a, ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.
LEV 18:30 Nʼihi ya, lezienụ anya ka unu debe iwu m, ka unu ghara ime ihe arụ ndị a, nke ndị buru unu ụzọ biri nʼala ahụ mere. Ka unu gharakwa imerụ onwe unu site nʼomume arụ ndị a. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”
LEV 19:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
LEV 19:2 “Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha: ‘Dịnụ nsọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, dị nsọ.
LEV 19:3 “ ‘Onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịsọpụrụ nne na nna ya, debekwa iwu m nyere maka ụbọchị izuike, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
LEV 19:4 “ ‘Unu akpọla isiala nye arụsị, unu emekwarala onwe unu chi ndị e ji ọla kpụọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
LEV 19:5 “ ‘Mgbe unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja udo, soronụ ụkpụrụ m nyere unu chụọ ya, ka m nabata ya.
LEV 19:6 Unu ga-eri ya nʼụbọchị ahụ unu chụrụ ya, maọbụ nʼụbọchị nke na-eso ụbọchị ahụ. Nke ọbụla fọdụrụ ruo ụbọchị nke atọ ka unu ga-esure ọkụ.
LEV 19:7 Ọ bụrụ na unu erie ya nʼụbọchị nke atọ ihe arụ ka ọ bụ. A gaghị anabata aja ọbụla unu ga-eri nʼụbọchị nke atọ.
LEV 19:8 Ikpe ga-ama onye ga-eri ya nʼụbọchị nke atọ nʼihi na o meela ka ihe nsọ Onyenwe anyị bụrụ ihe arụ. A ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
LEV 19:9 “ ‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ ubi niile, maọbụ chịkọtachaa irighiri ihe ubi niile fọdụrụ nʼala.
LEV 19:10 A ghọrọchakwala mkpụrụ vaịnị niile mịrị nʼelu vaịnị gị, maọbụ chịkọrọ mkpụrụ ndị dara nʼala. Hapụrụ ha ụmụ ogbenye na ndị ọbịa, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
LEV 19:11 “ ‘Unu ezula ohi. “ ‘Unu aghala ụgha. “ ‘Unu aghọgbula ibe unu.
LEV 19:12 “ ‘Unu aṅụla iyi ụgha, si otu a weta nkọcha nye aha Onyenwe anyị Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.
LEV 19:13 “ ‘Unu ejila ike pụnara onye agbataobi unu ihe ya, maọbụ zuru ihe o nwere nʼohi. “ ‘Kwụọnụ onye ọbụla unu goro ọrụ ụgwọ ọrụ ya ọsịịsọ. Unu echela ka chi bọọ tupu unu akwụọ ya ụgwọ ya.
LEV 19:14 “ ‘Akọchala onye ntị chiri, edochikwarala onye ìsì ihe nʼụzọ. Tụọ egwu Chineke. Abụ m Onyenwe anyị.
LEV 19:15 “ ‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, unu elela mmadụ anya nʼihu mgbe unu na-ekpe ikpe, ma onye unu na-ekpe ikpe ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Kama kpeenụ ikpe kwụ ọtọ.
LEV 19:16 “ ‘Unu ejegharịla na-agbasa okwu nkwujọ nʼetiti ndị mmadụ. “ ‘Emela ihe ọbụla ga-ebutere onye agbataobi gị ọnwụ. Abụ m Onyenwe anyị.
LEV 19:17 “ ‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya.
LEV 19:18 “ ‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu.
LEV 19:19 “ ‘Unu ga-edebe iwu m niile. “ ‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche. “ ‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi. “ ‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ.
LEV 19:20 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla akpọrọ nwaagbọghọ bụ ohu nwanyị nke a na-agbapụtabeghị, maọbụ nke na-enwerebeghị onwe ya, nke nwoke ọzọ chọrọ ịlụ, mee ka ha abụọ dinakọọ, a ga-ekpe ha abụọ ikpe nʼụlọikpe, ma a gaghị egbu ha, nʼihi na nwanyị ahụ abụghị onye nwe onwe ya.
LEV 19:21 Ma nwoke ahụ ga-eweta aja ikpe ọmụma nye Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ọ ga-abụkwa ebule ka ọ ga-eji chụọ aja ahụ.
LEV 19:22 Onye nchụaja ga-eji ebule aja ikpe ọmụma ahụ chụọrọ nwoke ahụ aja mkpuchi mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi mmehie o mere. A ga-agbaghakwara ya mmehie ya.
LEV 19:23 “ ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ kụọ mkpụrụ osisi dị iche iche, unu erila mkpụrụ osisi ahụ mịrị nʼafọ nke mbụ, ọ bụ ihe rụrụ arụ. Ruo nʼafọ nke atọ, ha bụ ihe rụrụ arụ. Unu agaghị eri ha.
LEV 19:24 Nʼafọ nke anọ, mkpụrụ nke osisi ndị ahụ niile ga-amị dị nsọ. Unu ga-eji ya nye Onyenwe anyị onyinye otuto.
LEV 19:25 Site nʼafọ nke ise, mkpụrụ ọbụla ga-abụ nke unu. Nʼụzọ dị otu a ihe ha ga-amịpụta ga-adị ukwuu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
LEV 19:26 “ ‘Unu erila anụ ọbụla ọbara dị nʼime ya. “ ‘Unu agbala afa maọbụ jụta mmụọ ase.
LEV 19:27 “ ‘Unu akpụchala agịrị isi dị gburugburu akụkụ isi unu, maọbụ chabie ọnụ ọnụ afụọnụ unu.
LEV 19:28 “ ‘Unu akala ihe ọbụla nʼahụ unu, nʼihi onye nwụrụ anwụ maọbụ jiri mma ọkụ dee ihe nʼahụ unu. Abụ m Onyenwe anyị.
LEV 19:29 “ ‘Emerụla nwa gị nwanyị site nʼịkwagide ya ka ọ bụrụ akwụna, ka ala unu ghara ijupụta nʼịgba akwụna na ihe ọjọọ dị iche iche.
LEV 19:30 “ ‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị izuike m. Sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
LEV 19:31 “ ‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
LEV 19:32 “ ‘Bilienụ ọtọ nʼihu okenye, sọpụrụnụ ndị okenye, ma tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.
LEV 19:33 “ ‘Mgbe onye ọbịa soro unu biri nʼala unu, unu emejọla ya.
LEV 19:34 Mesonụ onye ọbịa bi nʼetiti unu mmeso dịka ọ bụ otu nʼime ndị amụrụ nʼala. Hụnụ ha nʼanya dịka unu si hụ onwe unu, nʼihi na o nwere oge unu bụ ọbịa nʼala Ijipt. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
LEV 19:35 “ ‘Unu ejila ihe ọtụtụ aghụghọ mgbe unu na-atụ ihe dị ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu,
LEV 19:36 Jirinụ ezi ihe ọtụtụ tụọ ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu.
LEV 19:37 “ ‘Debenụ ụkpụrụ m niile, na iwu m niile, gbasoonụ ha. Abụ m Onyenwe anyị.’ ”
LEV 20:1 Onyenwe anyị sịrị Mosis,
LEV 20:2 “Gwa ụmụ Izrel, ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa ọbụla bi nʼetiti unu, nke weere nwa ya nye maka ịchụrụ Molek aja, aghaghị ime ka ọ nwụọ. Ndị mmadụ ga-ewere nkume tugbuo ya.
LEV 20:3 Mụ onwe m ga-emegide onye ahụ, bipụ ya site nʼetiti ndị ya, nʼihi na o merụọla ebe nsọ m, mee ka aha m gharakwa ịdị nsọ, site nʼiji ụmụ ya chụọrọ Molek aja.
LEV 20:4 Ọ bụrụ na ndị obodo elezie anya mee omume dịka a ga-asị na ha amaghị ihe onye ahụ mere, hapụkwa igbu ya, mgbe o were otu nʼime ụmụ ya nye Molek,
LEV 20:5 mụ onwe m ga-emegide onye ahụ na ezinaụlọ ya bipụ ha site nʼetiti ndị ya. Otu a kwa ka m ga-eme ya na ndị niile so ya merụọ onwe ha site nʼife arụsị Molek.
LEV 20:6 “ ‘Aga m edo ihu m megide onye ọbụla gara jụọ ase site nʼaka mmụọ ọjọọ, maọbụ onye gara na dibịa afa gbaa afa, site nʼiso ha kwaa iko. Aga m ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
LEV 20:7 “ ‘Doonụ onwe unu nsọ, ma dịkwanụ nsọ nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
LEV 20:8 Debenụ ụkpụrụ m niile, ma gbasoonụ ha nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo unu nsọ.
LEV 20:9 “ ‘Onye ọbụla kọchara nne ya maọbụ nna ya ka a ga-egbu nʼihi na ọ kọchara nne na nna ya. Ọbara onye dị otu a ga-adịkwa ya nʼisi.
LEV 20:10 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwoke ọzọ, ya bụ nwunye onye agbataobi ya, nwoke ahụ na nwanyị kwara iko ka a ga-egbu.
LEV 20:11 “ ‘Nwoke ọbụla ya na nwunye nna ya dinakọrọ nwe mmekọ, emerụọla nna ya. A ga-egbu nwoke ahụ na nwanyị ahụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
LEV 20:12 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwa ya, wetara onwe ha ikpe ọmụma, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ọ bụ arụ ka ha mere.
LEV 20:13 “ ‘Ọ bụrụ nwoke na nwoke ibe ya edinakọọ nwee ụdị mmekọ edina nwoke na nwanyị, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ihe ha mere bụ ihe rụrụ arụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
LEV 20:14 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwanyị na nne mụrụ ya, ajọ ihe ka ọ bụ. Nwoke ahụ na ndị inyom ndị ahụ ka a ga-akpọ ọkụ, ka ihe ọjọọ dị otu a hapụ ịdị nʼetiti unu.
LEV 20:15 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke na anụmanụ enwee mmekọrịta, a ga-egbu nwoke ahụ gbukwaa anụmanụ ahụ.
LEV 20:16 “ ‘Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla abịaruo anụmanụ ọbụla nso dinakwuru ya inwe mmekọ, a ga-egbu nwanyị ahụ na anụmanụ ahụ, nʼihi na ha kwesiri ọnwụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
LEV 20:17 “ ‘Nwoke ọbụla ya na nwanne ya nwanyị nwere mmekọ edina, maọbụ nwa afọ nne ya maọbụ nwa nwunye nna ya, a ga-ekpochapụ ha site nʼihu ọha mmadụ nʼihi na ọ bụ ihe ihere dị ukwuu ka ha mere. Ọ merụọla nwanne ya, nʼihi ya ikpe ọmụma dị ya nʼisi.
LEV 20:18 “ ‘Nwoke ọbụla nke ya na nwanyị nọ na nsọ nwanyị ya dinakọrọ nwee mmekọ ekpugheela adịghị ọcha nwanyị ahụ. Nwanyị ahụ nʼonwe ya ekpugheekwala adịghị ọcha nke ya. A ga-ebipụ ha abụọ site nʼetiti ndị ha.
LEV 20:19 “ ‘Ị gaghị enwe mmekọ edina nʼetiti gị na nwanne nwanyị nne gị maọbụ nwanne nwanyị nna gị, nʼihi na nke a bụ ihe nleda anya nye onye ọbara jịkọrọ gị na ya. Ikpe ọmụma ga-adịrị unu abụọ.
LEV 20:20 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla na nwunye nwanne nna ya edinaa, ọ bụ omume ileda anya nye nwanne nna ya. Ha ga-ebu mmehie ha. Ha ga-anwụ na-amụtaghị nwa.
LEV 20:21 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwunye nwanne ya, ọ bụ omume rụrụ arụ, nʼihi na ọ bụ ihe nleda anya nye nwanne ya. Ha ga-agba aka nwa.
LEV 20:22 “ ‘Debenụ iwu ndị a na ụkpụrụ ndị a, ma gbasoonụ ha ka ala ahụ m na-eduba unu nʼime ya hapụ imeghe ọnụ ya gbụpụ unu.
LEV 20:23 Unu agbasola omenaala ndị mba niile a m na-achụpụ site nʼala m na-enye unu, nʼihi na ha na-eme ihe ndị a niile m nyere unu nʼiwu emela. Ọ bụ nke a mere ihe banyere ha ji sọọ m oyi.
LEV 20:24 Ma agwala m unu sị, “Unu ga-eketa ala ha. Aga m enye ya unu ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kewapụtara unu doo unu iche site na mba ndị ọzọ niile.
LEV 20:25 “ ‘Unu aghaghị ịkpa oke nʼetiti anụmanụ ndị dị ọcha iri eri, na anụmanụ ndị na-adịghị ọcha, na nʼetiti anụ ufe dị ọcha iri eri na ndị rụrụ arụ. Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ maọbụ anụ ufe, maọbụ ihe ọzọ na-akpụgharị nʼala, ndị ahụ m kewapụrụ iche dịka ihe rụrụ arụ.
LEV 20:26 Unu ga-adị nsọ nye m, nʼihi na mụ, bụ Onyenwe anyị, dị nsọ. Ekewapụtala m unu, doo unu iche, site nʼetiti ndị mba ọzọ niile, ka unu bụrụ nke m.
LEV 20:27 “ ‘A ga-eji nkume tugbuo nwoke maọbụ nwanyị ọbụla nke na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa nọ nʼetiti unu ka ọ nwụọ. Ọbara ha ga-adịkwa ha nʼisi.’ ”
LEV 21:1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Gwa ndị nchụaja, ụmụ ndị ikom Erọn okwu sị ha, ‘Onye nchụaja ekwesighị imerụ onwe ya mgbe mmadụ nwụrụ nʼetiti ụmụnna ya.
LEV 21:2 Karịakwa ma onye ahụ bụ onye dị ya nnọọ nso, dịka nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị, maọbụ nwanne ya nwoke,
LEV 21:3 maọbụ nwanne ya nwanyị na-alụbeghị di, onye ọ na-elekọta nʼihi na o nweghị di. Nʼihi ya, o nwere ike merụọ onwe ya.
LEV 21:4 Ma ọ gakwaghị eme onwe ya ka ọ ghara ịdị ọcha nʼetiti ndị ọgọ ya, ma site otu a merụọ onwe ya.
LEV 21:5 “ ‘Ndị nchụaja ekwesighị ịkpụcha isi ha, maọbụ kpụchapụ akụkụ afụọnụ ha, maọbụ kaa ihe ọbụla nʼakpụkpọ ahụ ha.
LEV 21:6 Ha ga-abụ ndị dị nsọ nye Chineke ha, ndị na-agaghị emekwa ka aha Chineke ha ghara ịdị nsọ. Nʼihi na ọ bụ ha na-eche nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja nsure ọkụ, bụ nri Chineke ha. Nʼihi ya, ha aghaghị ịdị nsọ.
LEV 21:7 “ ‘Onye nchụaja agaghị alụ nwanyị e merụrụ site nʼịgba akwụna, maọbụ nwanyị lụtụrụla di nke kewapụrụ onwe ya site nʼahụ di ya, nʼihi na ndị nchụaja bụ ndị dị nsọ nye Chineke ha.
LEV 21:8 Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na ọ bụ ha na-eche nri Chineke nʼihu ya. Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị dị nsọ, mụ onwe m na-eme ka unu dị nsọ.
LEV 21:9 “ ‘Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja emerụọ onwe ya site nʼịghọ onye akwụna, o sitela na ndụ ọjọọ dị otu a wetara nna ya ihe ihere. A ga-akpọ ya ọkụ.
LEV 21:10 “ ‘Onyeisi nchụaja, onye ahụ sitere nʼetiti ụmụnna ya, onye awụsara mmanụ nsọ nʼisi ya, onye ahọrọ doo nsọ iyiri uwe onye nchụaja ahụ, agaghị ahapụ agịrị isi ya ka ọ kpasasịa, maọbụ dọwaa uwe ya.
LEV 21:11 Ọ gaghị abanye ebe ozu dị. Ọ gaghị emerụ onwe ya, ọ bụladị ma ozu ahụ ọ bụ nke nne ya maọbụ nke nna ya.
LEV 21:12 Ọ gaghị esi nʼebe nsọ Chineke ya pụọ, maọbụ mee ya ka ọ ghara ịdị nsọ, nʼihi na e doola ya nsọ site na ite ya mmanụ nsọ nke Chineke ya. Abụ m Onyenwe anyị.
LEV 21:13 “ ‘Nwanyị onyeisi nchụaja ga-alụ ga-abụ nwanyị na-amaghị nwoke.
LEV 21:14 Ọ gaghị alụ nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ nwanyị ya na di ya na-ebikwaghị, maọbụ nwanyị akwụna. Nwanyị ọ ga-alụ ga-abụ naanị nwanyị na-amaghị nwoke nke si nʼetiti ụmụnna ya,
LEV 21:15 ka ọ ghara ime ka ụmụ ya ghara ịdị nsọ nʼetiti ụmụnna ya. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ya nsọ.’ ”
LEV 21:16 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 21:17 “Gwa Erọn, ‘Nʼọgbọ niile nke na-abịa, o nweghị onye ọbụla nʼime ụmụ ụmụ gị nke akụkụ ahụ ya na-ezughị oke ga-abịa nso iwetara Chineke ya ihe oriri.
LEV 21:18 O nweghị nwoke ọbụla nwere ọrụsị ọbụla ga-abịa nso, o nweghị nwoke kpuru ìsì, maọbụ onye ngwụrọ, maọbụ onye imi mpịa, maọbụ onye ụkwụ maọbụ aka ya na-ezughị oke,
LEV 21:19 maọbụ onye ọkpụkpụ ụkwụ ya maọbụ ọkpụkpụ aka ya gbajiri,
LEV 21:20 maọbụ onye mkpumkpu azụ dị, maọbụ nwa akakpọ, maọbụ onye na-adịghị ahụzi ụzọ, maọbụ onye agba na-ata, maọbụ onye akpụkpa dị nʼahụ, maọbụ onye mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa.
LEV 21:21 O nweghị nwa nwa Erọn onye nchụaja ọbụla nwere ọrụsị ga-abịa iwetara Onyenwe anyị aja onyinye site nʼọkụ. Ebe ọ bụ na o nwere ọrụsị, ọ gaghị abịa nso iwetara Chineke ya nri.
LEV 21:22 Ma o nwere ike iri nri ahụ dịkarịsịrị nsọ nke sitere na nri Chineke ya, tinyekwara nri ahụ dị nsọ.
LEV 21:23 Kama ọ gaghị abịa nso akwa mgbochi ahụ maọbụ bịaruo ebe ịchụ aja nso, nʼihi ezughị oke ya. Ka ọ ghara imerụ ebe nsọ m, nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.’ ”
LEV 21:24 Ya mere Mosis nyere Erọn na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ Izrel niile iwu ndị a.
LEV 22:1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 22:2 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha jiri nsọpụrụ nabata onyinye dị nsọ nke ụmụ Izrel na-edo nsọ nye m, ka ha ghara imerụ aha nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
LEV 22:3 “Gwa ha sị, ‘Nʼọgbọ unu niile na-abịa, ọ bụrụ na enwee onye ọbụla nʼagbụrụ unu nke bịara nso nʼihe ndị ahụ dị nsọ ụmụ Izrel na-edo nsọ nye Onyenwe anyị, mgbe onye ahụ nọ ọnọdụ dịka onye rụrụ arụ, a ga-esi nʼihu m wezuga onye ahụ. Abụ m Onyenwe anyị.
LEV 22:4 “ ‘Onye ọbụla bụ nwa nwa Erọn nke ọrịa ekpenta na-arịa, maọbụ nke ihe si nʼahụ ya na-asọpụta agaghị eri aja dị nsọ tutu ruo mgbe e mere ka ọ dịrị ọcha. Ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ma ọ bụrụ na o metụ ozu aka, maọbụ onye mkpụrụ nwa na-esite nʼahụ awụsị,
LEV 22:5 maọbụ na o metụrụ anụ na-akpụgharị akpụgharị nʼala aka, nke na-emerụ ya, maọbụ na ọ metụrụ mmadụ aka nke mere ka ọ bụrụ onye rụrụ arụ nʼagbanyeghị ihe ọ bụ na-emerụ ya.
LEV 22:6 Onye ahụ metụrụ ihe ndị a aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ gaghị eri ihe nsọ ọbụla tutu ruo mgbe ọ sachara ahụ.
LEV 22:7 Mgbe anyanwụ dara ka ọ ga-adị ọcha, nweekwa ike iri ihe dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nri ya.
LEV 22:8 Ọ gaghị eri anụ nwụrụ anwụ, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu, nʼihi na ihe ndị a ga-emerụ ya. Abụ m Onyenwe anyị.
LEV 22:9 “ ‘Ndị nchụaja kwesiri idebe ụkpụrụ m, ka ha ghara ịbụ ndị ikpe mara si otu a nwụọ nʼihi na ha lelịrị ha anya. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.
LEV 22:10 “ ‘O nweghị onye ọbụla na-esiteghị nʼezinaụlọ ndị nchụaja ga-eri aja nsọ ahụ. Onye bụ ọbịa na onye e goro ọrụ nọ nʼụlọ onye nchụaja agaghị eri ya.
LEV 22:11 Otu ọ dị, ọ bụrụ na onye nchụaja weere ego nke aka ya gbata ohu, maọbụ na a mụrụ ohu ahụ nʼụlọ ya, ohu ahụ nwere ike iri aja nsọ ahụ.
LEV 22:12 Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja alụọ onye na-abụghị onye nchụaja, ọ gaghị eri ihe ọbụla site nʼime aja nsọ a.
LEV 22:13 Ma nwa nwanyị onye nchụaja nke di ya nwụrụ, maọbụ na ya na di ya ebikwaghị, ọ bụrụkwa na ọ mụtaghị nwa ọbụla, ọ lọghachi bịa biri nʼụlọ nna ya dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọ, o nwere ike iri nri dị nʼụlọ nna ya. Ọ dịkwaghị onye na-ekwesighị iri ya, nke ga-eri ya.
LEV 22:14 “ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla erie onyinye nsọ ahụ na-amaghị ama, ọ ga-eweghachiri onye nchụaja ihe niile o riri tụkwasịkwa ya otu ụzọ nʼụzọ ise ọzọ.
LEV 22:15 Ndị nchụaja ekwesighị imerụ onyinye nsọ ụmụ Izrel na-eche nʼihu Onyenwe anyị,
LEV 22:16 site nʼikwenye ka ndị mmadụ efu rie onyinye nsọ ahụ, si otu a wetara ndị riri ya ikpe ọmụma nke ya na nkwụghachi so. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.’ ”
LEV 22:17 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 22:18 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla, onye Izrel maọbụ onye ọbịa nʼIzrel, eweta aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị imezu nkwa o kwere, maọbụ dịka onyinye afọ ofufu,
LEV 22:19 ọ ga-eweta otu oke nke na-enweghị nkwarụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, ka a nabata ya nʼaha.
LEV 22:20 Ewebatala ihe ọbụla nke nwere nkwarụ, nʼihi na agaghị m anabata ya nʼaha gị.
LEV 22:21 Mgbe onye ọbụla wetara ehi maọbụ atụrụ maọbụ ewu site nʼigwe anụ, dịka onyinye aja udo ọ na-enye Onyenwe anyị maka imezu nkwa, maọbụ onyinye afọ ofufu, ọ ga-abụ nke na-enweghị ọrụsị maọbụ ntụpọ ọbụla tupu a nabata ya.
LEV 22:22 Anụmanụ ọbụla kpuru ìsì, maọbụ nke merụrụ ahụ, maọbụ nke ụkwụ maọbụ aka gbajiri, maọbụ nke akpụkpa dị nʼahụ ya, maọbụ ihe nwere ure, maọbụ nke ọnya dị nʼahụ, agaghị abụ ihe onyinye nye Onyenwe anyị. Unu atụkwasịkwala ha nʼebe ịchụ aja dịka onyinye nye Onyenwe anyị.
LEV 22:23 Unu nwere ike jiri ehi maọbụ atụrụ nke akụkụ ahụ ya tara ata, maọbụ nke otu akụkụ ya buru ibu karịa ibe ya chụọ aja onyinye si nʼobi, ma a gaghị e ji ya chụọ aja imezu nkwa.
LEV 22:24 Unu agaghị enye anụmanụ ọbụla nke mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa, maọbụ nke pịara apịa, maọbụ nke a dọwapụrụ adọwapụ maọbụ nke a chakapụrụ achakapụ, dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị. Unu enyekwala ụdị onyinye a nʼala unu.
LEV 22:25 Unu esitekwala nʼaka onye ọbịa nata ụdị onyinye a, ma webata ya dịka nri a na-enye Chineke unu. A gaghị anabata ha nʼọnọdụ unu, nʼihi na ha nwere nkwarụ, nwekwa ntụpọ.’ ”
LEV 22:26 Onyenwe anyị sịrị Mosis,
LEV 22:27 “Mgbe a mụrụ nwa ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu ọhụrụ, a ga-ahapụ ya na nne ya ụbọchị asaa. Site nʼụbọchị nke asatọ gaa nʼihu a ga-anabata ya dịka onyinye ihe oriri i ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
LEV 22:28 Egbula nne anụ na nwa ya nʼotu ụbọchị, maọbụ ehi maọbụ atụrụ.
LEV 22:29 “Mgbe unu na-achụrụ Onyenwe anyị aja ekele, chụọnụ ya nʼụzọ ahụ a ga-anabata ya.
LEV 22:30 Riekwanụ anụ aja ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, ka ọ hapụ ịfọdụ ruo echi ya. Abụ m Onyenwe anyị.
LEV 22:31 “Unu ga-edebe iwu m ndị a niile, mee ha nʼihi na abụ m Onyenwe anyị.
LEV 22:32 Unu emekwala ka aha m ghara ịdị nsọ. A ga-edo aha m nsọ nʼetiti ụmụ Izrel, nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo unu nsọ.
LEV 22:33 Ọ bụ m kpọpụtara unu site nʼala Ijipt ka m bụrụ Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.”
LEV 23:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
LEV 23:2 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka nye Onyenwe anyị, nke unu ga-ekwusa dịka mkpọkọta dị nsọ.
LEV 23:3 “ ‘Ụbọchị isii ka unu ga-eji rụọ ọrụ. Ma ụbọchị nke asaa, bụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, nʼebe ọbụla unu bi. Ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị.
LEV 23:4 “ ‘Ndị a bụ mmemme Onyenwe anyị a kara aka, mkpọkọta dị nsọ nke unu ga-ekwusa nʼoge a kara aka.
LEV 23:5 Nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa ahụ, nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ka Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị ga-adị.
LEV 23:6 Mmemme achịcha na-ekoghị eko Onyenwe anyị ka unu ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa ahụ. Abalị asaa ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
LEV 23:7 Nʼụbọchị mbụ nke mmemme a, unu ga-enwe mkpọkọta dị nsọ, ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-arụ ọrụ ọbụla.
LEV 23:8 Unu ga-eweta aja e sitere nʼọkụ chụọ nye Onyenwe anyị. Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.’ ”
LEV 23:9 Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya,
LEV 23:10 “Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-aga inye unu, ghọta mkpụrụ ihe ubi nke mbụ unu, unu ga-ewetara onye nchụaja otu ukwu ọka site nʼọka unu ghọtara nʼubi unu.
LEV 23:11 Ọ ga-anara unu ukwu ọka ahụ fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, ka a nabata ya. Ọ bụ nʼụbọchị ahụ ga-esote ụbọchị izuike ka onye nchụaja ga-efufe ya.
LEV 23:12 Nʼotu ụbọchị ahụ e fufere ukwu ọka ahụ, unu ga-ewere nwa ebule na-enweghị ntụpọ, nke gbara naanị otu afọ, chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.
LEV 23:13 Aja mkpụrụ ọka ga-eso aja nsure ọkụ a. Ọ ga-eji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ a gwara mmanụ oliv, ka ọ bụrụ ihe e surere nʼọkụ na-esi ezi isi ọma nye Onyenwe anyị. A ga-enyekwa iko mmanya atọ dịka onyinye ihe ọṅụṅụ
LEV 23:14 Unu agaghị eri achịcha, maọbụ ọka e ghere eghe, maọbụ ọka ọhụrụ tutu ruo mgbe unu buru ụzọ weta onyinye nye Chineke unu. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide ruo ọgbọ niile.
LEV 23:15 “ ‘Site nʼụbọchị ahụ sotere ụbọchị izuike, bụ ụbọchị ahụ unu wetara ukwu ọka nke onyinye mfufe, gụpụta izu asaa zuru ezu.
LEV 23:16 Gụpụtakwa iri ụbọchị ise site nʼụbọchị izuike ahụ mezuru izu asaa ahụ ma wetara Onyenwe anyị onyinye ọka ọhụrụ.
LEV 23:17 Site nʼebe ọbụla unu bi, unu ga-ewetara Onyenwe anyị ogbe achịcha abụọ nke unu ji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ, nke e ji ihe na-eko achịcha mee, ya bụ yiist, dịka aja mfufe nke mkpụrụ mbụ nye Onyenwe anyị.
LEV 23:18 Tinyere achịcha a, unu ga-eweta ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, na otu nwa oke ehi, na ebule abụọ. Ha ga-abụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ya na aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ, aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị.
LEV 23:19 Unu ga-ejikwa otu mkpi chụọ aja mmehie. Werekwa ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja udo.
LEV 23:20 Onye nchụaja ga-efufe ụmụ atụrụ abụọ ndị a, na achịcha ndị si na mkpụrụ mbụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha bụ aja dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ọ bụkwa ndị nchụaja ga-ewere ha dịka nri ha.
LEV 23:21 Nʼotu ụbọchị ahụ unu ga-akpọsakwa mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ ga-adịgide ebighị ebi site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile, nʼebe ọbụla unu bi.
LEV 23:22 “ ‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ niile nke ubi unu. Hapụrụnụ ha ụmụ ogbenye, na ndị ọbịa. Hapụkwara ha mkpụrụ ubi niile dara nʼala. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”
LEV 23:23 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 23:24 “Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Ụbọchị mbụ nke ọnwa nke asaa ga-abụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nke a ga-eji opi na-ada oke ụda cheta.
LEV 23:25 Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, kama unu ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.’ ”
LEV 23:26 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 23:27 “Ụbọchị nke iri nke ọnwa asaa a bụ ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ọ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nye unu. Unu ga-ata onwe unu ahụhụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ.
LEV 23:28 Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ nʼihi na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịchụ aja mkpuchi mmehie unu nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu.
LEV 23:29 Onye ọbụla na-ejighị ụbọchị ahụ weda onwe ya nʼala ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.
LEV 23:30 Aga m ebibikwa onye ọbụla rụrụ ọrụ nʼụbọchị ahụ.
LEV 23:31 Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide nye unu niile site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
LEV 23:32 Ọ ga-abụ ụbọchị izuike zuruoke nye unu, unu ga-ewedakwa onwe unu nʼala. Nʼụbọchị nke itoolu nke ọnwa ahụ, site nʼuhuruchi ruo nʼuhuruchi nke na-esote ya, unu ga-edebe izuike unu.”
LEV 23:33 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 23:34 “Gwa ụmụ Izrel, ‘Nʼụbọchị nke iri na ise, nʼọnwa nke asaa, ka unu ga-amalite mmemme Ụlọ Ikwu Onyenwe anyị. A ga-eme ya ụbọchị asaa.
LEV 23:35 Nʼụbọchị nke mbụ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ nʼụbọchị ahụ.
LEV 23:36 Nʼụbọchị ọbụla nʼime ụbọchị asaa ndị a niile ka a ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ. Nʼụbọchị nke asatọ ka mkpọkọta dị nsọ ga-adị. A ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nʼụbọchị a. Ọ bụ mkpokọta mmechi, nʼihi ya, a gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
LEV 23:37 (“ ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka, mgbe a ga-ekwusa mkpọkọta dị nsọ maka iwetara Onyenwe anyị onyinye nri, ya bụ, onyinye aja nsure ọkụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na aja dị iche iche, na onyinye ihe ọṅụṅụ dịka e sị hazie na ọ ga na-adị kwa ụbọchị.
LEV 23:38 Unu ga-enye onyinye ndị a, tinyere onyinye a na-enye Onyenwe anyị nʼụbọchị izuike, na tinyere onyinye ndị ọzọ unu na-enye na ihe ndị ọzọ unu kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu niile unu na-enye Onyenwe anyị.)
LEV 23:39 “ ‘Ya mere, malite nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa asaa, mgbe unu webatasịrị ihe ubi unu, meerenụ Onyenwe anyị mmemme ụbọchị asaa, ụbọchị nke mbụ, na ụbọchị nke asatọ ga-abụ ụbọchị izuike.
LEV 23:40 Nʼụbọchị nke mbụ, unu ga-ewere ụfọdụ mkpụrụ osisi dị mma nke si nʼosisi unu na-amị mkpụrụ, gbutekwa igu nkwụ, na alaka osisi nwere ahịhịa ndụ, na osisi pọpla, jiri ha mee mmemme obi ụtọ nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu ụbọchị asaa.
LEV 23:41 Mmemme ụbọchị asaa a ga-adị nye Onyenwe anyị nʼafọ niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ unu niile. Ọ bụkwa nʼọnwa nke asaa ka unu ga-eme mmemme a.
LEV 23:42 Nʼoge mmemme a, ụmụ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ e ji alaka osisi na ahịhịa wuo ụbọchị asaa. Ụmụ afọ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ dị otu a.
LEV 23:43 Nke a ga-echetara ọgbọ ụmụ Izrel niile na mgbe m kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, unu biri nʼụlọ e ji osisi na ahịhịa wuo nʼọzara. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”
LEV 23:44 Mosis gwara ụmụ Izrel ihe gbasara mmemme niile a kara aka nye Onyenwe anyị.
LEV 24:1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 24:2 “Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ, nke a na-agwaghị ihe, maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile.
LEV 24:3 Na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe Ihe Ama ahụ, nʼime ụlọ nzute, Erọn ga-amụnye oriọna ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nye ọgbọ niile dị nʼihu.
LEV 24:4 Ihe ọkụ ọlaedo a nụchara anụcha ndị ahụ dọọ nʼelu ihe ịdọkwasị oriọna, nʼihu Onyenwe anyị ga na-enwu ọkụ mgbe niile.
LEV 24:5 “Were ọka a kwọrọ nke ọma mee ogbe achịcha iri na abụọ. Jiri ihe ruru iko ọka asatọ mee otu ogbe achịcha ọbụla.
LEV 24:6 Doo achịcha ndị a nʼahịrị abụọ nʼelu tebul ahụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, nke dị nʼihu Onyenwe anyị. Ogbe achịcha isii ga-adị nʼotu ahịrị.
LEV 24:7 Nʼogologo ahịrị ọbụla tinye insensi a na-agwaghị ihe, ka ọ bụrụ ihe nọchiri achịcha ndị a dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
LEV 24:8 A ga-edo achịcha ndị a nʼihu Onyenwe anyị oge niile, ụbọchị izuike niile, nʼọnọdụ ụmụ Izrel, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi.
LEV 24:9 Ọ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom, bụ ndị ga-eri ya nʼime nʼebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ, site nʼoke ha mgbe niile, nke sitere nʼonyinye nsure ọkụ e chere nye Onyenwe anyị.”
LEV 24:10 Otu nwokorobịa, nke nna ya bụ onye Ijipt ma nne ya bụ onye Izrel, sitere nʼetiti ụmụ Izrel pụta. O ruo na nwoke a nne ya bụ onye Izrel na otu nʼime ndị ikom Izrel malitere ịlụ ọgụ.
LEV 24:11 Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ nwoke ahụ nne ya bụ onye Izrel kwuluru Aha ahụ kọchaa ya. Nʼihi ya, a kpọrọ ya ikpe nʼihu Mosis. (Aha nne ya bụ Shelomit, nwa Dibri, onye ebo Dan.)
LEV 24:12 Ha tinyere nwoke ahụ nʼụlọ mkpọrọ na-eche ka ha nụ okwu Onyenwe anyị, ịmata ihe ha ga-eme ya.
LEV 24:13 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
LEV 24:14 “Kpụrụ onye nkwulu ahụ gaa nʼazụ obodo. Ndị niile nụrụ okwu ahụ o kwuru ga-ebikwasị ya aka ha nʼisi. Mgbe ahụ, ọgbakọ Izrel niile ga-eji nkume tugbuo ya.
LEV 24:15 Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla kọchara Chineke ya ga-ebu mmehie ya nʼisi ya.
LEV 24:16 Onye ọbụla kwuluru aha Onyenwe anyị ka a ga-egbu. Mmadụ niile ga-agbakọ jiri nkume tugbuo onye ahụ. Onye ọbụla kwuluru Aha ahụ, maọbụ ọbịa, maọbụ nwa afọ ala, ka a ga-egbu.
LEV 24:17 “ ‘Onye ọbụla gburu mmadụ ka a ga-egbu.
LEV 24:18 Onye gburu anụ ụlọ na-abụghị nke ya, ga-akwụghachi ụgwọ ya. Ndụ ga-alara ndụ.
LEV 24:19 Onye ọbụla merụrụ mmadụ ibe ya ahụ, a ga-emerụkwa onye ahụ ahụ nʼebe o merụrụ ibe ya ahụ.
LEV 24:20 Onye tijiri mmadụ ọkpụkpụ, a ga-etiji ọkpụkpụ nke ya. Anya ga-alara anya, eze ga-alakwara eze. Otu e si merụọ mmadụ ahụ, ka a ga-esi merụọkwa onye merụrụ ya ahụ.
LEV 24:21 Onye ọbụla gburu anụ ụlọ onye ọzọ, ga-akwụ ụgwọ ya. Ma a ga-egbu onye ọbụla gburu mmadụ.
LEV 24:22 Unu ga-enwe otu iwu nke ga-adị nye ndị amụrụ nʼala, dịkwara ndị ọbịa niile. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”
LEV 24:23 Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Izrel okwu, nʼihi ya ha dọkpụụrụ onye nkwulu ahụ pụọ nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya nʼebe ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
LEV 25:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị sị ya,
LEV 25:2 “Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ m ga-enye unu, unu ga-eme ka ala ahụ nwee afọ izuike nke ya nye Onyenwe anyị.
LEV 25:3 Afọ isii ka unu ga-akụ ihe nʼubi, afọ isii ka unu ga-ewe ihe ubi, kwachaakwa alaka osisi vaịnị unu.
LEV 25:4 Ma mgbe o ruru afọ nke asaa, unu ga-ahapụ ala ubi unu ka o zuo ike, afọ izuike nye Onyenwe anyị. Unu akụla ihe ọbụla nʼubi unu maọbụ kwachaa osisi vaịnị unu.
LEV 25:5 Unu agaghị ewe ihe ubi ọbụla ga-epupụtara onwe ha nʼoge a, maọbụ tụtụọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị ga-ada ada. Nʼihi na afọ ahụ bụ afọ ozuzu ike dịrị ala ubi niile.
LEV 25:6 Ihe ubi puputara nʼala ahụ niile nʼafọ izuike ahụ bụ nri dịrị unu onwe unu, na ndị odibo nwoke na nwanyị unu niile, na onye i goro ọrụ, na onye ọbịa bi nʼetiti unu.
LEV 25:7 Ihe ubi ahụ dịkwara anụ ụlọ gị, na anụ ọhịa bi nʼala gị. Ihe ọbụla puputara nʼala bụ ihe unu ga-eri.
LEV 25:8 “ ‘Gụpụta afọ izuike asaa, afọ asaa, ụzọ asaa. Ngụkọ afọ izuike ndị a niile ga-enye iri afọ anọ na itoolu.
LEV 25:9 Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa, zipụ onye ga-egbu opi ike, ya bụ, nʼụbọchị mkpuchi mmehie, a ga-egbu opi ike nʼala Izrel niile.
LEV 25:10 Doonụ afọ nke iri ise ahụ nsọ, kwusaakwa inwere onwe nye mmadụ niile nʼala ahụ niile. Afọ ahụ ga-abụ afọ inwere onwe nye unu. Onye ọbụla nʼime unu ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ezinaụlọ ya, onye ọbụla kwa ga-alaghachi nʼagbụrụ ya.
LEV 25:11 Afọ nke iri ise bụ afọ inwere onwe nye unu. A gaghị akụ ihe ọbụla nʼubi, a gakwaghị ewe ihe ubi ọbụla puputara nʼonwe ya, maọbụ mkpụrụ osisi vaịnị mịrị nʼonwe ya.
LEV 25:12 Ọ bụ afọ inwere onwe, bụrụkwa afọ dị nsọ nye unu, nke onye ọbụla ga-eri naanị ihe e wetara nʼubi.
LEV 25:13 “ ‘Onye ọbụla ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ya, nʼafọ inwere onwe a.
LEV 25:14 “ ‘Ọ bụrụ na i resiri onye agbataobi gị ala, maọbụ na o nwere nke ọ zụrụ site nʼaka gị, unu aghọgbula ibe unu.
LEV 25:15 Ị ga-azụrụ ala site nʼaka onye agbataobi dịka ọnụọgụgụ afọ si dị site nʼafọ inwere onwe. Ha ga-eresi gị ya dịka ọnụọgụgụ afọ ole fọdụrụ maka ịkọ ihe nʼala ahụ.
LEV 25:16 Ọ bụrụ na a zụrụ ala ahụ nso nso mmemme iri afọ ise a, ọnụahịa ala ahụ ga-adị ala, ọ bụrụkwanụ na ọ dị anya site na mmemme ahụ, ọnụahịa ya ga-adị elu, nʼihi na ụgwọ onye ahụ na-akwụ bụ ụgwọ ugboro ole ọ ga-akụ ihe nʼala ahụ.
LEV 25:17 Unu emegbula ibe unu kama tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
LEV 25:18 “ ‘Gbasoonụ ụkpụrụ m, ma lezie anya imezu ihe m nyere nʼiwu, ka unu nwee ike ibi obi udo nʼala ahụ.
LEV 25:19 Mgbe ahụ, ala ga-amị mkpụrụ ya, unu ga-eriju afọ, birikwa nʼala ahụ nʼudo.
LEV 25:20 Unu nwere ike jụọ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị ga-eri nʼafọ nke asaa ahụ ebe ọ bụ na anyị agaghị akụ ihe ọbụla, maọbụ wee ihe ubi ọbụla nʼafọ ahụ?”
LEV 25:21 Aga m ezitere unu ngọzị dị ukwuu nʼafọ nke isii, nke ga-eme ka ala mee ihe omume nke ga-ezuru unu afọ atọ.
LEV 25:22 Mgbe unu ga-akụ ihe ubi nʼafọ nke asatọ unu ga na-eri site nʼowuwe ihe ubi ochie unu tutu ruo nʼafọ nke itoolu mgbe unu ga-ewebata ihe ubi ọhụrụ.
LEV 25:23 “ ‘Chetanụ na ala bụ nke m, nʼihi nke a, o kwesighị ka unu ree ala ọbụla kpamkpam. Unu bụ naanị ndị ọbịa na ndị nlekọta nye m.
LEV 25:24 Nʼala obibi unu niile, unu ga-enye ohere maka mgbapụta ala erere ere.
LEV 25:25 “ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu aghọọ onye ogbenye si otu a ree ala ya, nwanna ya dị ya nso ga-abịa gbapụta ala ahụ.
LEV 25:26 Ọ bụrụ na-enweghị onye ga-agbapụta ala ahụ nye ha, ma ha mesịa ghọọ ndị bara ụba nwekwa ihe ga-ezu ịgbapụta ala ahụ nʼonwe ha.
LEV 25:27 A ga-agụ afọ ole gara site na mgbe o rere ala ahụ, nyeghachi ya ego ole o kwesiri inweta. Onye rere ala ga-alaghachikwa nʼala ya.
LEV 25:28 Ọ bụrụ na onyenwe ya enweghị ike ịchọta ego ọ ga-eji gbara ya, ala ahụ ga-adị nʼaka onye ahụ zụrụ ya tutu ruo nʼafọ inwere onwe. Mgbe ahụ ọ ga-ewerekwa ala ahụ nyeghachi ya onye resiri ya.
LEV 25:29 “ ‘Onye ọbụla rere ụlọ obibi dị nʼobodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nwere ikike mgbapụta ya naanị mgbe otu afọ zuru site na mgbe e rere ya. Nʼoge ahụ ka onye rere ya nwere ike ịgbaghachi ya.
LEV 25:30 Ọ bụrụ na a gbapụtaghị ya tupu otu afọ agafee, ụlọ ahụ dị nʼime obodo nwere mgbidi ga-abụ nke onye ahụ zụrụ ya mgbe niile, bụrụkwa nke ụmụ ụmụ ya. A gaghị enyeghachikwa ya mgbe afọ inwere onwe ruru.
LEV 25:31 Ma ụlọ ndị dị nʼobodo nta na-enweghị mgbidi a ga-agụ ha dịka ihe dị nʼọhịa. E nwere ike ịgbapụta ha, ha bụkwa nke a ga-eweghachite mgbe afọ inwere onwe ruru.
LEV 25:32 “ ‘Ma banyere obodo niile nke ndị Livayị dị iche iche. Ha nwere ikike ịgbapụta ụlọ ha dị nʼime nketa ha mgbe ọbụla.
LEV 25:33 Ihe onwunwe ndị Livayị bụ nke e nwere ike ịgbapụta, bụ ndị a, ụlọ niile e rere nke dị nʼobodo ha nwere. Ọ ga-abụ nʼafọ inwere onwe ka aga enwetaghachi ha, nʼihi na ụlọ ndị ahụ dị nʼobodo ndị Livayị bụ naanị oke ha nwere nʼetiti ụmụ Izrel.
LEV 25:34 Ma a gaghị ere ala ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara obodo ha gburugburu ere, nʼihi ọ bụ ihe ha nwee nʼọha ruo ebighị ebi.
LEV 25:35 “ ‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye ruo na o nweghị ike inyere onwe ya aka, ọ dị gị nʼaka inyere ya aka, kpọbata ya ka ọ bịa biri nʼụlọ gị dịka ị ga-esi kpọbata onye ọbịa. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-anọgide biri nʼetiti unu.
LEV 25:36 Tụọ egwu Chineke, kwerekwa ka nwanna gị soro gị biri nʼala ahụ. A nakwala ụma maọbụ ọmụrụnwa ọbụla.
LEV 25:37 Ị gaghị ana ọmụrụnwa nʼego i gbazinyere ha, maọbụ rie uru site na nri i resiri ha.
LEV 25:38 Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, inye unu ala Kenan, na ị bụ Chineke unu.
LEV 25:39 “ ‘Ọ bụrụ na onye Izrel ọbụla adaa ogbenye, resi gị onwe ya, emela ka o jere gị ozi dịka onye ohu.
LEV 25:40 Kama ị ga-emeso ya mmeso dịka ị ga-esi meso onye ọrụ e goro ego, maọbụ dịka onye ọbịa nọ nʼetiti unu. Ọ ga-ejere gị ozi tutu ruo afọ inwere onwe.
LEV 25:41 Nʼafọ ahụ, ị ga-ahapụ ha na ụmụ ha ka ha laghachikwuru ndị ikwu ha, si otu a nwetaghachi ala ubi dị nʼezinaụlọ ha.
LEV 25:42 Nʼihi na a kpọpụtara m ndị Izrel site nʼala Ijipt ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi. Ya mere, a gaghị ere ha mgbe ọbụla dịka ohu.
LEV 25:43 A gakwaghị emegbu ha nʼụzọ dị njọ. Tụọnụ egwu Chineke unu.
LEV 25:44 “ ‘Ma unu nwere ike gbara ndị ohu nwoke maọbụ nwanyị site nʼetiti ndị mba ọzọ niile bi nʼakụkụ unu. Unu nwere ike site nʼebe ahụ zụta ndị ohu.
LEV 25:45 Unu nwere ike ịzụ ndị ohu site nʼetiti ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, maọbụ site nʼetiti ndị agbụrụ ha a mụrụ nʼala Izrel. Ndị dị otu a ga-abụkwa ihe onwunwe unu.
LEV 25:46 Unu nwere ike kenye ha ụmụ unu dịka ihe nketa, ma mee ha ndị ohu unu ụbọchị ndụ ha niile. Ma unu agaghị eji aka ike chịa onye Izrel ibe unu.
LEV 25:47 “ ‘Ọ bụrụ na onye ọbịa bi nʼetiti unu aghọọ ọgaranya, ma otu nʼime ụmụnna unu adaa ogbenye were onwe ya resi onye ọbịa ahụ bi nʼetiti unu, maọbụ were onwe ya resi nwanna ndị ikwu onye ọbịa ahụ,
LEV 25:48 ha nwere ikike ịgbapụta ya mgbe ha resiri onwe ha. Otu nʼime ụmụnna ya nwere ike gbapụta ha.
LEV 25:49 Nwanne nne ya, maọbụ nwanne nna ya, maọbụ nwanna nʼikwu ha ọbụla nwere ike ịgbapụta ya. Ọ nwekwara ike ịgbapụta onwe ya ma ọ bụrụ na ọ kpata ego.
LEV 25:50 Ya na onye ahụ o resiri onwe ya ga-agụ afọ ole ọ bụ site na mgbe o rere onwe ya ruo nʼafọ inwere onwe. Ego a ga-akwụ nʼihi ịgbapụta ya ga-abụ ego ọ ga-efu ịkwụ ohu ọzọ ụgwọ ịrụ ọrụ ọnụọgụgụ afọ ndị ahụ niile.
LEV 25:51 Ọ bụrụ nʼọtụtụ afọ fọdụrụ, ọ ga-esite nʼọnụ ego e rere ha kwụọ nke dị ukwu dịka ego mgbapụta ha. Naanị ihe ntakịrị ga-apụ nʼime ego ahụ.
LEV 25:52 Ọ bụrụ naanị afọ ole na ole fọdụrụ tupu afọ inwere onwe eruo, ọ ga-agụkọ ihe ego ahụ pụtara, kwụọ ya maka ịgbara onwe ya dịka o kwesiri.
LEV 25:53 A ga-emeso ha dịka ndị ọrụ e goro ego kwa afọ, ma ị ga-ahụ na onye ha nọ nʼokpuru ya agaghị eji aka ike chịa ha.
LEV 25:54 “ ‘Ma ọ bụrụ na e nweghị ike gbapụta ya site nʼụzọ ndị a niile, ya na ụmụ ya ga-enwere onwe ha mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru.
LEV 25:55 Nʼihi na mụ ka ụmụ Izrel bụ ndị ohu nye. Ha bụ ndị ohu m, ndị m kpọpụtara site nʼala Ijipt. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
LEV 26:1 “ ‘Unu emerela onwe unu arụsị ọbụla, maọbụ guzobe oyiyi apịrị apị, maọbụ ogidi nkume ọbụla ọtọ, nye onwe unu. Unu edokwala nkume a pịrị apị ọbụla nʼala unu maka ịkpọ isiala nye ya. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
LEV 26:2 “ ‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị Izuike m, sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
LEV 26:3 “ ‘Ọ bụrụ na unu ejegharịa nʼụkpụrụ m, lezie anya debe iwu m niile,
LEV 26:4 aga m enye unu mmiri ozuzo nʼoge ya, nke ga-eme ka ala unu mịa ọtụtụ ihe ubi. Osisi unu niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ mgbe niile.
LEV 26:5 Unu ga-anọgide na-azọcha ọka tutu ruo mgbe unu ga-aghọ mkpụrụ vaịnị unu, owuwe ihe ubi mkpụrụ vaịnị unu ga-adịgidekwa ruo oge ịkụ mkpụrụ nʼubi. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-enwe nri ga-ezuru unu, unu ga-ebikwa nʼudo nʼala unu.
LEV 26:6 “ ‘Aga m eme ka udo dịrị nʼala ahụ, unu ga-edina ala, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka unu tụọ egwu ọbụla. Aga m ewezuga site nʼetiti unu ajọ anụ ọhịa, mma agha agaghị esitekwa nʼala unu bi nʼime ya gafee.
LEV 26:7 Unu ga-achụ ndị iro unu ọsọ. Ha ga-ada nʼihu unu site na mma agha.
LEV 26:8 Mmadụ ise nʼime unu ga-achụ narị mmadụ ọsọ. Narị mmadụ nʼetiti unu ga-achụkwa iri puku mmadụ ọsọ. Ndị iro unu ga-ada nʼihu unu site na mma agha.
LEV 26:9 “ ‘Aga m eji ihuọma leta unu, mee ka unu mụbaa ma jupụta nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m nʼebe unu nọ dịgide.
LEV 26:10 Unu ga-enwebiga mkpụrụ ubi oke ruo na mgbe unu ka nọ na-eri ndị ochie unu ga-ewezuga ha nʼakụkụ maka inye ohere iwebata ihe ubi ọhụrụ.
LEV 26:11 Aga m eme ka ebe obibi m dịrị nʼetiti unu. Agaghị m asọ unu oyi.
LEV 26:12 Aga m ejegharị nʼetiti unu, bụrụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị m.
LEV 26:13 Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, ka unu ghara ịbụ ndị ohu ọzọ. Etijiela m mkpọrọ igwe nke ịbụ ohu unu, mee ka unu bụrụ ndị ji nganga ejegharị.
LEV 26:14 “ ‘Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa imezu ihe ndị a m nyere unu iwu ya,
LEV 26:15 ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaso ụkpụrụ m, sọọ iwu m ndị a oyi, si otu a mebie ọgbụgba ndụ m,
LEV 26:16 mgbe ahụ, aga m eme ka oke ụjọ, na ọrịa na-ebibi ebibi, na ahụ ọkụ, bịakwasị unu. Ọrịa ndị a ga-eme ka anya unu daa mba, ọ ga-eripịakwa anụ ahụ unu. Unu ga-akụ mkpụrụ ubi nʼubi unu ma ndị iro unu ga-eri ha.
LEV 26:17 Aga m eguzo megide unu nʼoge ibu agha, mee ka ndị iro unu merie unu nʼagha. Unu ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ unu ọsọ. Ndị kpọrọ unu asị ga-achịkwa unu.
LEV 26:18 “ ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike ju ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, aga m enye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu.
LEV 26:19 Aga m etiji ịnya isi nganga unu, mee ka mbara eluigwe dịịrị unu dịka igwe, elu ala unu na-azọkwasị ụkwụ ga-adịkwa dịka bronz.
LEV 26:20 Unu ga-adọgbu onwe unu nʼọrụ nʼefu, nʼihi na ala unu agaghị emepụtara unu ihe omume ya, osisi nke ala unu agaghị amịkwa mkpụrụ ya.
LEV 26:21 “ ‘Ọ bụrụkwa na mgbe nke a mesịrị, unu anọgidekwa jụ ime ihe m nyere nʼiwu, aga m eme ka ntaramahụhụ unu dịrị ukwuu, ugboro asaa ọzọ, nʼihi mmehie unu.
LEV 26:22 Aga m ezite anụ ọhịa megide unu. Ha ga-adọgbu ụmụ unu, bibie anụ ụlọ unu, meekwa ka unu dị nta nʼọnụọgụgụ, ruo na ndị a ga-ahụ nʼokporoụzọ unu ga-adị ole na ole.
LEV 26:23 “ ‘Ọ bụrụkwa na unu anọgide jụ ịdọ aka na ntị m, chie ntị nọgide na-ebu agha nnupu isi unu megide m,
LEV 26:24 mụ onwe m ga-ebu agha megide unu. Aga m eti unu ugbo ihe otiti asaa, nʼihi mmehie unu.
LEV 26:25 Aga m ewebata mma agha nʼebe unu nọ, ịbọ ọbọ nʼihi ọgbụgba ndụ m unu mebiri. Mgbe unu ga-agba ọsọ gbaba nʼobodo unu, aga m ezite ihe mbibi ga-ebibi unu nʼebe ahụ. Aga m enyefekwa unu nʼaka ndị iro unu.
LEV 26:26 Aga m eme ka unu hapụ inwe ihe oriri ga-ezuru unu. Otu ite nri naanị ka ndị inyom iri ga-eji sie nri ha nwere. Ha ga-eji ihe ọtụtụ tụọ ya mgbe ha na-eke ya. Unu ga-eri ya, ma afọ agaghị eju unu.
LEV 26:27 “ ‘Ọ bụrụkwa na unu agaa nʼihu jụ ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, nọgide na-emegide m,
LEV 26:28 mgbe ahụ, aga m egosi unu oke iwe m, nye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu.
LEV 26:29 Unu ga-eri anụ ụmụ unu ndị ikom, na anụ ụmụ unu ndị inyom.
LEV 26:30 Aga m ebibikwa ụlọ arụsị unu niile dị nʼelu ugwu, gbutuo ebe ịchụ aja niile unu na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi. Aga m atụkọta ozu unu nʼelu arụsị unu na-enweghị ume ndụ, ka unu bụrụ ihe m na-asọ oyi.
LEV 26:31 Aga m eme ka obodo unu niile tọgbọrọ nʼefu, kụdasịakwa ebe nsọ unu niile. Agaghị m anabatakwa isisi ụtọ nke aja unu.
LEV 26:32 Aga m eme ka ala unu tọgbọrọ nʼefu, mee ka ọnọdụ ịdị ala unu bụrụ ihe ga-eju ndị iro unu ga-ebi nʼime ya anya.
LEV 26:33 Aga m achụsa unu na mba niile, mịpụta mma agha m jiri ya chụso unu ọsọ. Ala unu ga-atọgbọrọ nʼefu, a ga-etikpọkwa obodo unu niile.
LEV 26:34 Mgbe ahụ, ala ahụ ga-ezu ike, ogologo oge ndị ahụ niile ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Mgbe unu ga-anọ dịka ndị ohu nʼala ndị iro unu. Ala ahụ ga-ezu ike, imejupụta afọ izuike ya niile.
LEV 26:35 Ogologo oge niile ala ahụ tọgbọrọ nʼefu, ala ahụ ga-ezu ike, ụdị izuike ọ na-enweghị nʼafọ izuike ndị ahụ unu bi nʼime ya.
LEV 26:36 “ ‘Ma ndị ahụ fọdụrụ ndụ nʼime unu, aga m etinye ịda mba nʼobi ha nʼala ndị iro ha. Mkpọtụ ahịhịa nke ifufe na-ebugharị ga-eme ka ha gbapụ ọsọ. Ha ga-agba ọsọ dịka ndị si nʼihu mma agha na-agba ọsọ. Ha ga-ada mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ.
LEV 26:37 Nʼezie, ha ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ. Ha ga-adagide ibe ha mgbe ha na-agba ọsọ a, dịka ndị si nʼebe a na-alụ agha na-agbapụ ọsọ. Unu agaghị enwe ike iguzo nʼihu ndị iro unu.
LEV 26:38 Unu ga-ala nʼiyi nʼetiti ndị mba ọzọ, ala ndị iro unu ga-eri unu.
LEV 26:39 Ndị ahụ a hapụrụ na ndụ nʼetiti unu ga-ata ahụhụ nʼala ndị iro ha nʼihi mmehie ha. Ha ga-atakwa ahụhụ nʼihi mmehie nke nna nna ha.
LEV 26:40 “ ‘Ma ọ bụrụ na ha ekwupụta mmehie ha niile, na mmehie niile nke ndị nna nna na ha na ha mehiere megide m, mmehie ekwesighị ntụkwasị obi ha, na mmehie nnupu isi ha, nke ha mehiere megide m,
LEV 26:41 nke mere ka m doo onwe m imegide ha, na izipụ ha gaa nʼala ndị iro ha, ọ bụrụ na ha eweda onwe ha ala nabata ntaramahụhụ m nyere ha nʼihi mmehie ha
LEV 26:42 aga m echeta ọgbụgba ndụ mụ na Jekọb gbara, ọgbụgba ndụ mụ na Aịzik gbara, na ọgbụgba ndụ mụ na Ebraham gbara. Aga m echeta ala ahụ.
LEV 26:43 Ma ala ahụ aghaghị ịtọgbọrọ nʼefu. Ọ ghakwaghị inwezu izuike ruuru ya, oge ndị ahụ ọ tọgbọrọ nʼefu, mgbe ha na-ebighị nʼime ya. Ha ga-anata ntaramahụhụ ruuru ha nʼihi na ha jụrụ iwu m, sọọkwa ụkpụrụ m oyi.
LEV 26:44 Ma ewezugakwa ihe ndị a niile, agaghị m ajụ ha, maọbụ sọọ ha oyi, ruo na ibibi ha kpamkpam mgbe ahụ ha nọ nʼala ndị iro ha. Agakwaghị m emebi ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke ha.
LEV 26:45 Kama nʼihi ha, aga m echeta ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, ịbụ Chineke ha, ndị ahụ m kpọpụtara site nʼala Ijipt nʼihu mba niile. Abụ m Onyenwe anyị.’ ”
LEV 26:46 Ndị a bụ iwu, na ụkpụrụ na ndụmọdụ Onyenwe anyị guzobere nʼugwu Saịnaị, nʼetiti ya onwe ya, na ụmụ Izrel, site nʼaka Mosis.
LEV 27:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
LEV 27:2 “Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na mmadụ e kwee nkwa pụrụ iche iji mmadụ nye Onyenwe anyị onyinye, ihe ndị a ka ọ ga-eji gbara onye ahụ:
LEV 27:3 nʼisi nwoke ọbụla gbara iri afọ abụọ ruo iri afọ isii, ọ ga-akwụ iri ọlaọcha shekel ise, dịka ihe ọtụtụ ebe nsọ si dị.
LEV 27:4 Nʼisi nwanyị ọbụla gbara iri afọ abụọ ruo iri afọ isii ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel atọ.
LEV 27:5 Nʼisi nwoke gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel abụọ. Nʼisi nwanyị gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye ọlaọcha shekel iri.
LEV 27:6 A ga-akwụrụ nwantakịrị nwoke gbara site otu ọnwa ruo afọ ise, ọlaọcha shekel ise, kwụọra nwantakịrị nwanyị gbara otu ọnwa ruo afọ ise ọlaọcha shekel atọ.
LEV 27:7 Nʼisi nwoke gafere iri afọ isi, a ga-enye ọlaọcha shekel iri na ise. Nʼisi nwanyị gafere iri afọ isi a ga-enye ọlaọcha shekel iri.
LEV 27:8 Ọ bụrụ na e nwee onye ogbenye na-enweghị ego ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ndị a, a ga-akpọtara ya onye nchụaja, onye ga-ekwubi ihe onye ahụ kwere nkwa ga-akwụ dịka ego o nwere ruru.
LEV 27:9 “ ‘Ọ bụrụ anụ ụlọ dị mma inye Onyenwe anyị dịka onyinye ka e kwere nkwa inye, anụ ụlọ e nyere Onyenwe anyị ga-aghọ ihe dị nsọ.
LEV 27:10 Onye kwere nkwa inye ya enweghị ike iji anụ ụlọ nke ahụ ya na-ezughị oke gbanwere anụ ụlọ ahụ na-enweghị ntụpọ. O nwekwaghị ike iji anụ ụlọ ahụ na-enweghị ntụpọ gbanwere nke anụ ahụ ya na-ezughị oke. Ọ bụrụ na o mee otu a, anụ ụlọ nke mbụ, na nke abụọ, ga-abụ ihe dị nsọ.
LEV 27:11 Ọ bụrụ na anụ ụlọ o ji kwee nkwa bụ anụ ụlọ rụrụ arụ, ụdị anụ ụlọ ahụ a jụrụ ịnabata dịka onyinye maka iji ya chụọ aja nye Onyenwe anyị, a ga-akpụtara onye nchụaja anụ ụlọ ahụ.
LEV 27:12 Ọ bụ ya ka ọ dịrị ikpebi ma anụ ụlọ ahụ ọ dị mma, ma ọ jọrọ njọ. Ọnụ ego ọbụla onye nchụaja kpebiri, ka onye wetara anụ ụlọ ahụ ga-akwụ.
LEV 27:13 Ọ bụrụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ụgwọ anụ ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa anụ ụlọ ahụ.
LEV 27:14 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ enye ụlọ ya, dịka ihe ga-adị nsọ nye Onyenwe anyị, onye nchụaja ga-ekpebi maọbụ ụlọ dị mma, ma ọ bụkwanụ ụlọ jọrọ njọ. Ọ ga-ekwukwa ihe bụ ọnụahịa ụlọ ahụ.
LEV 27:15 Ọ bụrụ na onye ahụ nke na-edo ụlọ ya nsọ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ụlọ ahụ. Emesịa, ụlọ ahụ ga-abụkwa nke ya.
LEV 27:16 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ ewere mpaghara ala ubi ezinaụlọ ya nye Onyenwe anyị ka ihe ido nsọ, ihe a ga-eji mata ọnụahịa ala ahụ ga-abụ ụdị ihe ubi e nwere ike ịkụ nʼime ya. Ọnụahịa ala ubi e nwere ike ịkụnye ọka balị ruru otu ihe ọtụtụ homa, ga-abụ iri mkpụrụ ego ọlaọcha shekel ise.
LEV 27:17 Ọ bụrụ nʼime afọ inwere onwe ka o doro ala ahụ nsọ, agaghị agbanwe ọnụahịa ya.
LEV 27:18 Ma ọ bụrụ na o doro ala ahụ nsọ mgbe afọ inwe onwe ahụ gafere, onye nchụaja ga-agụkọrọ ya ọnụahịa ya dịka afọ ole ọ fọdụrụ mgbe mmemme afọ inwere onwe ọzọ ga-adị. A ga-ewebilatakwa ihe ọnụahịa ya ruru.
LEV 27:19 Ọ bụrụ na onye doro ala ahụ nsọ achọọ ịgbara ala ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ahụ onye nchụaja kpebiri, tụkwasị ya ego ruru otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ala ahụ. Mgbe ahụ ala ahụ ga-abụkwa nke ya.
LEV 27:20 Ọ bụrụ na ọ gbapụtaghị ala ahụ, maọbụ na o resila ya onye ọzọ, a gaghị agbapụtakwa ala ahụ ọzọ.
LEV 27:21 Mgbe mmemme afọ inwere onwe ruru, ala ahụ ga-aghọ ala dị nsọ, ala e doro nsọ nye Onyenwe anyị. Ndị nchụaja ga-ewere ya ka ọ bụrụ nke ha.
LEV 27:22 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ e doro Onyenwe anyị ala ubi ọ zụrụ azụ nsọ, nke na-abụghị ala ezinaụlọ ha,
LEV 27:23 onye nchụaja ga-agụ afọ ole ọ fọdụrụ ruo mmemme afọ inwere onwe. Ọ ga-agwa onye ahụ ego ole ọ ga-akwụ nʼihi ya. Ego ọbụla ọ kwụrụ nʼụbọchị ahụ ga-abụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị.
LEV 27:24 Mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru, onye nwe ala ahụ, ya bụ onye ahụ e si nʼaka ya zụọ ya, ga-ewerekwa ala ya.
LEV 27:25 Ọnụahịa ọbụla a ga-ekpebi ga-abụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. Iri gera abụọ ga-abụ otu shekel.
LEV 27:26 “ ‘A gaghị edo nwa mbụ anụmanụ mụtara nsọ maọbụ ehi maọbụ atụrụ nʼihi na ha bụ nke Onyenwe anyị.
LEV 27:27 Ọ bụrụ otu nʼime anụ ndị ahụ rụrụ arụ, a ga-agbara ya nʼọnụ ego nke akara bụ ọṅụ ahịa ya, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya. Ọ bụrụkwanụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọghị ịgbarakwa ya, a ga-ere ya nʼọnụ ahịa dịka o ruru.
LEV 27:28 “ ‘A gaghị ere, maọbụ gbara ihe ọbụla mmadụ nwere, nke o doro nsọ nye Onyenwe anyị, maọbụ mmadụ, maọbụ ala ezinaụlọ, maọbụ anụ ụlọ, nʼihi na ihe ọbụla nke e wezugara iche bụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye Onyenwe anyị.
LEV 27:29 “ ‘Mgbapụta ọbụla adịghị nye onye ọbụla e doro nsọ nye mbibi. A ghaghị ime ka ọ nwụọ.
LEV 27:30 “ ‘Otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile si nʼala, maọbụ mkpụrụ ọghịgha nke ubi, maọbụ mkpụrụ nke osisi mịrị, bụ nke Onyenwe anyị. Ha bụ ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
LEV 27:31 Onye ọbụla chọrọ ịgbara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe ubi ya aghaghị ịkwụ ọnụahịa ya, tụkwasị ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa e kwesiri ire ya.
LEV 27:32 Otu ụzọ nʼụzọ iri nke igwe ehi na atụrụ niile, anụ nke iri ọbụla nke na-agabiga nʼokpuru mkpanaka onye ọzụzụ atụrụ mgbe a na-agụ ha ọnụ, ga-abụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị.
LEV 27:33 A gaghị ahọ anụ ụlọ a na-enye Onyenwe anyị ahọ, ile ma ha dị mma, maọbụ na ha dị njọ. A gaghị agbanwekwa ha. Ọ bụrụ na a gbanwee ha, ndị e ji gbanwee ha na ndị a na-achọ ịgbanwe ga-aghọ ihe dị nsọ, a gaghị agbarakwa ha.’ ”
LEV 27:34 Ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis nʼugwu Saịnaị ka ọ nye ụmụ Izrel.
NUM 1:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị, nʼime ụlọ nzute, nʼụbọchị nke mbụ, nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ, mgbe ụmụ Izrel pụtachara site nʼobodo Ijipt. Ọ sịrị,
NUM 1:2 “Gaa gụọ ma chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile e nwere nʼetiti ọgbakọ Izrel, dịka ebo ha na agbụrụ ha si dị, na dịka ezinaụlọ ha si dịkwa. Depụta aha nwoke ọbụla nʼotu na otu.
NUM 1:3 Gị na Erọn ga-agụkọta ndị ikom Izrel niile gbara iri afọ abụọ maọbụ karịa ọnụ, bụ ndị tozuru ije agha. Unu ga-edo ha nʼusuu, nʼusuu.
NUM 1:4 Otu nwoke, site nʼebo Izrel ọbụla, onye bụ onyendu ezinaụlọ, ga-esonyere unu nʼọrụ a.
NUM 1:5 “Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ ga-enyere unu aka. “Site nʼebo Ruben, Elizọ na Shedeua,
NUM 1:6 site nʼebo Simiọn, Shelumiel nwa Zurishadai,
NUM 1:7 site nʼebo Juda, Nashọn nwa Aminadab,
NUM 1:8 site nʼebo Isaka, Netanel nwa Zua,
NUM 1:9 site nʼebo Zebụlọn, Eliab nwa Helọn,
NUM 1:10 Site nʼụmụ Josef: site nʼebo Ifrem, Elishama nwa Amihud site nʼebo Manase, Gamaliel nwa Pedazo
NUM 1:11 site nʼebo Benjamin, Abidan nwa Gidiọn
NUM 1:12 site nʼebo Dan, Ahieza nwa Amishadai
NUM 1:13 site nʼebo Asha, Pagịel nwa Okran
NUM 1:14 site nʼebo Gad, Eliasaf nwa Deuel
NUM 1:15 site nʼebo Naftalị, Ahira nwa Enan.”
NUM 1:16 Ndị a bụ ndị ikom e si nʼọgbakọ ahụ họpụta, ndị bụ ndị ndu ebo dị iche iche nʼIzrel. Ha bụ ndị ndu ebo niile dị nʼIzrel.
NUM 1:17 Mosis na Erọn nabatara ndị ikom ndị a, bụ ndị e depụtara aha ha.
NUM 1:18 Emesịa, ha kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile ka ha zukọọ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa abụọ. Ndị niile zukọrọ kọwara ikwu ha na ezinaụlọ ha si pụta nʼotu na otu. Ma ndị ikom niile gbara site nʼiri afọ abụọ gbagoo ka e denyere aha ha nʼakwụkwọ nʼotu na otu,
NUM 1:19 dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu. Otu a kwa ka Mosis si gụọ ha ọnụ nʼọzara Saịnaị.
NUM 1:20 Ụmụ Ruben, bụ ọkpara Izrel: Ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo; ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 1:21 Ọnụọgụgụ ndị niile si nʼebo Ruben dị iri puku anọ, puku isii na narị ise (46,500).
NUM 1:22 Site nʼụmụ Simiọn, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 1:23 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Simiọn dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ (59,300).
NUM 1:24 Site nʼụmụ Gad, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 1:25 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Gad dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise (45,650).
NUM 1:26 Site nʼụmụ Juda, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 1:27 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Juda dị iri puku asaa, puku anọ na narị isii (74,600).
NUM 1:28 Site nʼụmụ Isaka, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 1:29 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Isaka dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ (54,400).
NUM 1:30 Site nʼụmụ Zebụlọn, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 1:31 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Zebụlọn dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ (57,400).
NUM 1:32 Site nʼụmụ Josef, ya bụ ụmụ Ifrem, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 1:33 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Ifrem dị iri puku anọ na narị ise (40,500).
NUM 1:34 Site nʼụmụ Manase, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 1:35 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Manase dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ (32,200).
NUM 1:36 Site nʼụmụ Benjamin, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 1:37 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Benjamin dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ (35,400).
NUM 1:38 Site nʼụmụ Dan, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 1:39 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Dan dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa (62,700).
NUM 1:40 Site nʼụmụ Asha, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 1:41 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Asha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise (41,500).
NUM 1:42 Site nʼụmụ Naftalị, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dị ka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 1:43 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Naftalị dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).
NUM 1:44 Ndị a bụ ndị ikom Mosis na Erọn, na ndị ndu Izrel iri na abụọ ndị ahụ gụrụ ọnụ, onye ọbụla nʼime ha nọchitere anya ezinaụlọ ya.
NUM 1:45 Ndị Izrel niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị nwere ike ije agha ka a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị.
NUM 1:46 Mgbakọ ọnụọgụgụ ndị a niile dị, narị puku isii, puku atọ, narị ise na iri ise (603,550).
NUM 1:47 A gụnyekọtaghị ọnụọgụgụ ebo nna nna Livayị nʼịgụ ọnụ a,
NUM 1:48 nʼihi na Onyenwe anyị gwara Mosis, sị,
NUM 1:49 “Ị gaghị agụ ndị ebo Livayị ọnụ. Ị gakwaghị agbakọnye ọnụọgụgụ ha nʼọnụọgụgụ ndị Izrel.
NUM 1:50 Kama, ị ga-ahọpụta ndị Livayị ka ha bụrụ ndị nlekọta ụlọ nzute Ihe Ama, na ngwongwo niile, na ihe niile dị nye ya. Ọ bụ ha ga-ebu ụlọ nzute ahụ na ngwongwo ya niile: ha ga na-elekọta ihe banyere ya, ọ bụkwa gburugburu ya ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha.
NUM 1:51 Mgbe ọbụla kwa a ga-ebugharị ya maka njem, ọ bụ ọrụ ha iweda ya. Mgbe ọbụla a ga-eguzo ya ọtọ, ọ bụkwa ọrụ ndị Livayị iguzobe ya ọtọ. Onye ọbụla ọzọ ga-abịa nso ka a ga-egbu.
NUM 1:52 Ebo Izrel ndị ọzọ ga-enwe ebe dị iche nye onwe ha, ebe ha ga-ewu ụlọ ikwu ha. Ha ga-akwụbakwa ọkọlọtọ nke ha, igosi aha ebo ha.
NUM 1:53 Ndị Livayị ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute Ihe Ama ahụ, ka iwe ọkụ m ghara ịbịakwasị nʼahụ nzukọ ụmụ Izrel. Ọ bụ ọrụ ndị Livayị ilekọta ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.”
NUM 1:54 Ya mere, Izrel mere ihe ndị a niile Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
NUM 2:1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị ha,
NUM 2:2 “Ụmụ Izrel ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute, nʼebe dịpụturu adịpụ site nʼụlọ nzute ahụ. Onye ọbụla ga-ama ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ọkọlọtọ ebo ya, ha na ihe ịrịbama nke ụlọ ha.”
NUM 2:3 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, usuu ndị agha ebo Juda, ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha ga-abụ Nashọn nwa Aminadab.
NUM 2:4 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ya dị puku iri asaa na anọ, na narị isii (74,600)
NUM 2:5 Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Isaka ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Netanel nwa Zua.
NUM 2:6 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ (54,400).
NUM 2:7 Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Zebụlọn ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Eliab nwa Helọn.
NUM 2:8 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ (57,400).
NUM 2:9 Ọnụọgụgụ ndị niile a gụkọtara ha na Juda nʼọwụwa anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku asatọ na puku isii na narị anọ (186,400). Ha ga-ebu ụzọ bulie ije.
NUM 2:10 Nʼakụkụ ndịda ka usuu ndị agha ebo Ruben ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Elizọ nwa Shedeua.
NUM 2:11 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku isii na narị ise (46,500).
NUM 2:12 Nʼakụkụ ha ka ebo Simiọn ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Shelumiel nwa Zurishadai.
NUM 2:13 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ (59,300).
NUM 2:14 Ebo Gad ga-esokwa ha. Onyendu ha bụ Eliasaf nwa Deuel.
NUM 2:15 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise (45,650).
NUM 2:16 Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ruben bikọrọ na ndịda ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na otu, na narị anọ na iri ise (151,450) dịka usuu ndị agha ha si dị. Ebo atọ a bụ ndị na-eso ebo atọ nke mbụ ahụ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.
NUM 2:17 Ka ụlọ nzute na-azọli ije, ụlọ ikwu ndị Livayị ga-anọ nʼetiti ụlọ ikwu ndị ọzọ. Ha ga-ebili ije nʼusoro dịka ha si maa ụlọ ikwu ha. Ndị ọbụla nʼọnọdụ ha, nʼokpuru ọkọlọtọ nke na-akọwa ndị ha bụ.
NUM 2:18 Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ka ebo Ifrem ga-ama ụlọ ikwu ha dịka ọkọlọtọ ha si dị. Onyendu ha bụ Elishama nwa Amihud.
NUM 2:19 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ na narị ise (40,500).
NUM 2:20 Ebo Manase ga-amakwa ụlọ ikwu nʼakụkụ ha. Onyendu ha bụ Gamaliel nwa Pedazo.
NUM 2:21 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ (32,200).
NUM 2:22 Nʼakụkụ ha ka ebo Benjamin ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Abidan nwa Gidiọn.
NUM 2:23 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ (35,400).
NUM 2:24 Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ifrem bikọrọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, puku asatọ na narị mmadụ (108,100). Ha niile na-esokwa nʼazụ ndị Livayị na ụlọ nzute ahụ. Ndị a bụ ndị na-eso nʼọnọdụ nke atọ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.
NUM 2:25 Ebo Dan na usuu ndị agha ha ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ elu elu nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai
NUM 2:26 Ọnụọgụgụ usuu ha dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa (62,700).
NUM 2:27 Nʼakụkụ ha ka ebo Asha ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Pagịel nwa Okran.
NUM 2:28 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise (41,500).
NUM 2:29 Otu aka ahụ ka ebo Naftalị ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Ahira nwa Enan.
NUM 2:30 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).
NUM 2:31 Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Dan bikọrọ nʼakụkụ elu elu nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na puku asaa na narị isii (157,600). Ha ga-abụ ndị ga-ekpe azụ bilie ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha.
NUM 2:32 Ndị a bụ ndị Izrel, ndị a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. Ndị ikom niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka usuu ha dị iche iche si dị, narị puku isii, puku atọ na narị ise na iri ise (603,550) nʼọnụọgụgụ.
NUM 2:33 Ma otu ọ dị, a gụnyeghị ebo Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel ndị ọzọ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
NUM 2:34 Ya mere, ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Otu a ka ha si maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Otu a kwa ka ha si ebuli ije. Onye ọbụla nʼime ha dịka ebo ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 3:1 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Erọn na Mosis nʼoge Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị.
NUM 3:2 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Erọn, Nadab, ọkpara ya, Abihu, Elieza na Itama.
NUM 3:3 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Erọn, ndị e tere mmanụ ịbụ ndị nchụaja, ndị e doro nsọ nʼihi ije ozi dịka ndị nchụaja.
NUM 3:4 Ma Onyenwe anyị mere ka Nadab na Abihu nwụọ, nʼihu ya nʼime ọzara Saịnaị, mgbe ha ji ọkụ na-adịghị nsọ wetara ya onyinye. Ebe ọ bụ na ha amụtaghị ụmụ ndị ikom nke aka ha, ọ bụ naanị Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja ogologo ụbọchị ndụ nna ha bụ Erọn.
NUM 3:5 Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
NUM 3:6 “Kpọkọtaa ebo Livayị niile were ha nyefee Erọn onye nchụaja nʼaka, ka ha bụrụ ndị inyeaka ya.
NUM 3:7 Ha ga-ejere ya na nzukọ Izrel niile ozi nʼụlọ nzute ahụ site na ịrụ ọrụ metụtara ebe obibi ahụ.
NUM 3:8 Ha ga-elekọta ngwongwo ụlọ nzute, rụọ ọrụ metụtara ndị Izrel niile mgbe ha na-eje ozi ha nʼebe obibi ahụ.
NUM 3:9 Were ndị Livayị nyefee Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼaka. Ọ bụ ha ka a ga-esi nʼetiti ụmụ Izrel nyefee ha nʼaka kpamkpam.
NUM 3:10 Họpụta Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị na-eje ozi dịka ndị nchụaja. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ka a ga-egbu.”
NUM 3:11 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
NUM 3:12 “Anarala m ndị Livayị dịka ndị nọchitere anya ụmụ ndị ikom mbụ niile a mụrụ nʼetiti ndị Izrel. Ndị Livayị niile bụ nke m.
NUM 3:13 Nʼihi na ihe niile meghere akpanwa bụ nke m. Site nʼụbọchị ahụ m gburu ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt ka m doro ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼetiti ndị Izrel nsọ nye onwe m, ma mmadụ, ma anụmanụ bụ nke m. Abụ m Onyenwe anyị.”
NUM 3:14 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị sị ya,
NUM 3:15 “Gụọ, chọpụta ihe ọnụọgụgụ ebo Livayị bụ. Gosi ikwu na ezinaụlọ onye ọbụla si nʼime ya pụta. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile site nʼonye dị otu ọnwa.”
NUM 3:16 Ya mere, Mosis gụrụ ha ọnụ dịka iwu ọ natara site nʼokwu Onyenwe anyị si dị.
NUM 3:17 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Livayị: Geshọn, Kohat na Merari.
NUM 3:18 Ndị a bụ aha ndị ikwu Geshọn dịka ezinaụlọ ha si dị: Libni na Shimei.
NUM 3:19 Ụmụ Kohat dịka ikwu ha si dị: Amram, Izha, Hebrọn na Uziel.
NUM 3:20 Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị: Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị agbụrụ Livayị, dịka ezinaụlọ ha si dị.
NUM 3:21 Ndị Geshọn bụ ndị ikwu Libni na Shimei. Ndị a bụ ndị ikwu Geshọn.
NUM 3:22 Ọnụọgụgụ ndị ikom dị otu ọnwa gbagoo dị puku asaa na narị ise (7,500).
NUM 3:23 Ndị ikwu Geshọn mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼazụ ụlọ nzute.
NUM 3:24 Onyendu ezinaụlọ ndị Geshọn bụ Eliasaf nwa Lael.
NUM 3:25 Ọrụ dịrị ụmụ Geshọn bụ ilekọta ụlọ nzute ahụ, na ụlọ ikwu ya, na ihe mkpuchi ya, na akwa mgbochi ọnụ ụzọ ụlọ nzute.
NUM 3:26 Ọ dịkwa ha nʼaka ilekọta akwa mgbochi niile nke ogige gbara ya gburugburu, na akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ogige ahụ. Ha nwekwara ọrụ ilekọta ebe ịchụ aja, na ụdọ niile, na ozi niile metụtara ihe ndị a.
NUM 3:27 Nke Kohat bụ ikwu ndị Aram, ndị Izha, ndị Hebrọn na ndị Uziel. Ndị a bụ ndị ikwu Kohat.
NUM 3:28 Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku asatọ na narị isii (8,600). Ọrụ dịrị ndị Kohat bụ ilekọta ebe nsọ.
NUM 3:29 Ndị ikwu Kohat mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ndịda nke ebe nsọ.
NUM 3:30 Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Kohat bụ Elizafan nwa Uziel.
NUM 3:31 Ọrụ e tinyere ha nʼaka bụ ilekọta igbe ọgbụgba ndụ, tebul ahụ, ihe ịdọba oriọna ahụ na ebe ịchụ aja. Ihe ọzọ bụ ilekọta ngwongwo niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ, akwa mgbochi na ihe niile metụtara otu e si e ji ha eje ozi.
NUM 3:32 Onyeisi ndị ndu nke ndị Livayị bụ Elieza nwa Erọn, onye nchụaja. Ọ bụ ya na-elekọta ndị ọrụ ha bụ ihu maka ihe niile metụtara ebe nsọ ahụ.
NUM 3:33 Ndị Merari bụ ikwu Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị ikwu Merari.
NUM 3:34 Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku isii na narị abụọ (6,200).
NUM 3:35 Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Merari bụ Zuniel nwa Abihail. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ.
NUM 3:36 Ọrụ e tinyere nʼaka ndị ikwu Merari bụ ilekọta mbudo niile nke ụlọ nzute ahụ, na mkpọrọ ya niile, ụkwụ ya niile, na ngwongwo niile e kwesiri iji rụọ ọrụ metụtara ha.
NUM 3:37 Ọrụ ndị ọzọ bụ ilekọta ogidi osisi niile dị gburugburu ogige ahụ ha na ụkwụ ha, ǹtu na ụdọ ha niile.
NUM 3:38 Mpaghara akụkụ ọwụwa anyanwụ nʼihu ụlọ nzute ahụ ka e debere maka ụlọ ikwu Mosis na Erọn, na nke ụmụ ya ndị ikom. Ọrụ ha bụ ilekọta ebe nsọ ahụ nʼaha ụmụ Izrel niile. Onye ọbụla ọzọ bịara ebe nsọ ahụ nso ka a ga-egbu.
NUM 3:39 Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom Livayị niile Mosis na Erọn nwetara mgbe a gụrụ ha ọnụ nʼikwu nʼikwu dịka iwu Onyenwe anyị nyere ha si dị, bụ iri puku abụọ na puku abụọ (22,000). Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị site nʼotu ọnwa gaa nʼihu.
NUM 3:40 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Gụọ ndị ikom Izrel niile e buru ụzọ mụọ, ndị dị site nʼotu ọnwa gbagoo. Chọpụta ọnụọgụgụ ha, dee aha ha niile nʼakwụkwọ.
NUM 3:41 Nabata ndị Livayị ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ndị ikom niile e bụrụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Ọzọkwa, anụ ụlọ ndị Livayị niile bụ nke m, nʼọnọdụ ụmụ mbụ nke anụ ụlọ niile a mụrụ nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel niile. Abụ m Onyenwe anyị.”
NUM 3:42 Ya mere, Mosis gụrụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼIzrel, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu,
NUM 3:43 chọpụta na ọnụọgụgụ ndị ikom e buru ụzọ mụọ site nʼonye dị otu ọnwa ruo nʼokenye dị iri puku abụọ na puku abụọ na narị abụọ na iri asaa na atọ (22,273).
NUM 3:44 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị:
NUM 3:45 “Nye m ndị Livayị nʼọnọdụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Nyekwa m anụ ụlọ ndị Livayị niile nʼọnọdụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Ndị Livayị bụ nke m. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
NUM 3:46 Ihe a ga-eji gbara narị ụmụ ndị ikom Izrel abụọ na iri ndị ikom asaa, na atọ (273) ndị e buru ụzọ mụọ mapụtara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị
NUM 3:47 bụ ego ruru shekel ise, na isi onye ọbụla, ụdị shekel ebe nsọ, nke ọtụtụ ya bụ iri gera abụọ.
NUM 3:48 Were ego mgbapụta a nye Erọn na ụmụ ndị ikom ya.”
NUM 3:49 Ya mere, Mosis natara ego mgbapụta ahụ nʼisi onye ọbụla dị nʼọnụọgụgụ ndị ahụ mara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị.
NUM 3:50 Ego niile ọ natara site nʼaka ndị ikom Izrel niile e bụ ụzọ mụọ bụ ọlaọcha ruru puku shekel na narị shekel atọ na iri isii na ise (1,365), dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị.
NUM 3:51 Mosis nyere Erọn na ụmụ ya ego mgbapụta ndị a dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
NUM 4:1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
NUM 4:2 “Gụọ ọnụ chọpụta, ọnụọgụgụ ụmụ Kohat dị nʼebo Livayị dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 4:3 Gụọ ndị ikom niile gbarala iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị tozuru ije ozi nʼụlọ nzute.
NUM 4:4 “Nke a bụ ọrụ dịrị ndị Kohat nʼụlọ nzute, ilekọta ihe ndị ahụ kachasị ịdị nsọ.
NUM 4:5 Mgbe ọmụma ụlọ ikwu ahụ ga-ebili ije ha, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eburu ụzọ banye nʼụlọ nzute ahụ wetuo akwa mgbochi ahụ, jiri ya kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
NUM 4:6 Mgbe ahụ, ha ga-agbakwasị akpụkpọ anụ ehi mmiri nʼelu akwa mgbochi ahụ, sakwasịkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ nʼelu ya, tinyekwa mkpọrọ osisi niile nʼoghere ha kwesiri ịdị.
NUM 4:7 “Nʼelu tebul ahụ na-adị nʼihu Onyenwe anyị, ha ga-agbasa akwa anụnụ anụnụ tụkwasịkwa efere niile, ngaji niile, ọkwa niile na iko aja ihe ọṅụṅụ. Achịcha ahụ na-adịgide nʼelu ya ga-adịkwa ebe ọ dị.
NUM 4:8 Ha ga-agbasakwa akwa uhie nʼelu ya, jiri akpụkpọ anụ ehi mmiri gbokwasịkwa nʼelu akwa uhie ahụ. Mgbe ahụ, ha ga-etinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu tebul nʼime oghere o kwesiri ịdị.
NUM 4:9 “Ọzọ, ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ sachie ihe ịdọba oriọna ahụ nke na-enye ìhè, ya na oriọna ya niile, mkpa ya niile na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile na ite mmanụ ya niile, e ji awụnye ya mmanụ.
NUM 4:10 Emesịa, ha ga-eji akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya na ngwongwo ya niile, tụkwasị ya nʼelu ihe e ji ebu ya.
NUM 4:11 “Ha ga-ejikwa akwa anụnụ anụnụ tụsaa nʼelu ebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo mee, werekwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya, tinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu ya nʼoghere dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.
NUM 4:12 “Ihe ndị ọzọ niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ ka ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ kekọtaa, jirikwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ha, tụkwasị ha nʼelu ihe e ji ebu ha.
NUM 4:13 “A ga-ekpopụ ntụ dị nʼebe ịchụ aja bronz ahụ, jiri akwa na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, sachie ebe ịchụ aja bronz ahụ.
NUM 4:14 Emesịa ha ga-atụkwasị ihe niile e ji eje ozi nʼebe ịchụ aja ahụ nʼelu akwa ahụ, ihe dịka ite ịgụ ọkụ, na ndụdụ, na ihe ikpofu ntụ, na efere ịkwọsa mmiri niile. Akpụkpọ anụ ehi mmiri ka a ga-eji sachie ha niile. Ma nʼikpeazụ, mkpọrọ osisi e ji ebu ya ka a ga-etinye nʼebe ha kwesiri ịdị.
NUM 4:15 “Mgbe Erọn na ụmụ ya kpuchisịrị ụlọnsọ ahụ na ngwongwo niile nke ebe nsọ ahụ, dịka ndị Izrel niile na-ejikere ibili ije, mgbe ahụ ka ndị Kohat ga-abata buru ihe ndị a. Ma ha agaghị emetụ ihe nsọ ndị a aka ka ha ghara ịnwụ. Ọrụ ibu ihe ndị a niile dị nʼime ụlọ nzute dịrị Ndị Kohat.
NUM 4:16 “Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka ọrụ ndị a dị nʼaka: mmanụ e ji amụ ọkụ, na ihe nsure ọkụ e ji ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ mee, na onyinye mkpụrụ ọka a na-enye ụbọchị niile, na mmanụ nsọ ahụ. Nʼaka ya ka ọrụ metụtara nlekọta ụlọ nzute ahụ niile, ihe niile dị nʼime ya na ngwongwo nsọ ya dị iche iche dị.”
NUM 4:17 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị,
NUM 4:18 “Unu ekwekwala ka agbụrụ Kohat bụrụ ndị e bipụrụ site nʼebo Livayị.
NUM 4:19 Otu a ka unu ga-esi meso ha mmeso ime ka ha dịrị ndụ, ghara ịnwụ, mgbe ha bịara nso ihe ndị ahụ dịkarịsịrị nsọ, Erọn na ụmụ ya ga-esoro ha banye gosi onye ọ bụla nʼime ha ihe ha ga-ebu.
NUM 4:20 Ma ndị Kohat ekwesighị ịbanye ilekwasị ihe nsọ ndị ahụ anya, ka ha ghara ịnwụ.”
NUM 4:21 Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
NUM 4:22 “Gụọ ọnụ chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Geshọn, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 4:23 Mata ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị kwesiri ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise.
NUM 4:24 “Ihe ga-abụ ọrụ ndị ikwu Geshọn ga-abụ ije ozi na ibu ibu.
NUM 4:25 Ha ga-ebu akwa mgbochi ebe obibi ahụ na nke ụlọ nzute ahụ, tinyere akwa e ji sachie ya na akpụkpọ anụ ehi mmiri e ji mee elu ụlọ ya na akwa mgbochi dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
NUM 4:26 Ha ga-ebukwa akwa mgbochi niile e ji gechie ogige ahụ, akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ama ogige gbara ebe ịchụ aja na ụlọ nzute ahụ gburugburu, ụdọ ya niile na ngwongwo niile e ji eje ozi.
NUM 4:27 Ọrụ ha niile, maọbụ ibu ihe ma ọ bụkwanụ ịrụ ọrụ ọzọ, ga-abụ site na ntụziaka Erọn na ụmụ ya. Ị ga-ekenye ha ọrụ dịrị ha nʼihe niile bụ ihe ha ga-ebu.
NUM 4:28 Nke a bụ ọrụ dịịrị ikwu Geshọn nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.
NUM 4:29 “Gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Merari dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 4:30 Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute Onyenwe anyị.
NUM 4:31 Ije ozi ha dịka o si metụta ọrụ ụlọ nzute bụ ibu mbudo ụlọ nzute ahụ niile, osisi ntụbichi ya niile, ogidi osisi na ụkwụ ya niile;
NUM 4:32 tinyere ogidi osisi niile dị ogige ahụ gburugburu na ụkwụ ha niile, ǹtu niile, ụdọ ha niile na ngwongwo ndị ọzọ e ji arụ ọrụ metụtara ihe ndị a ha ga-ebu. Kenye nwoke ọbụla ọrụ nke ya. Kpọ onye ahụ aha nye ya ọrụ nke ya.
NUM 4:33 Nke a bụ ọrụ dịịrị ndị agbụrụ Merari mgbe ha na-aga ozi ha nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.”
NUM 4:34 Ya mere, Mosis na Erọn na ndị ndu nzukọ ụmụ Izrel gụrụ ma chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Kohat, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 4:35 Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute ahụ
NUM 4:36 dịka ikwu ha si dị bụ puku abụọ na narị asaa na iri ise (2,750).
NUM 4:37 Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Kohat ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
NUM 4:38 A gụrụ ụmụ Geshọn ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 4:39 Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute,
NUM 4:40 dịka ikwu ha si dị bụ puku abụọ na narị isii na iri atọ (2,630).
NUM 4:41 Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Geshọn ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
NUM 4:42 A gụrụ ụmụ Merari ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 4:43 Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute
NUM 4:44 dịka ikwu ha si dị bụ puku atọ na narị abụọ (3,200).
NUM 4:45 Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Merari ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
NUM 4:46 Otu a ka Mosis na Erọn na ndị ndu ụmụ Izrel si gụọ ndị Livayị niile ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
NUM 4:47 Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi na ibu ụlọ nzute ahụ
NUM 4:48 dị puku asatọ na narị ise na iri asatọ (8,580).
NUM 4:49 Dịka iwu Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis si dị, e kenyere onye ọbụla ọrụ ya ma gwa ya ihe o kwesiri ibu. A gụrụ ha ọnụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
NUM 5:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 5:2 “Nye ndị Izrel iwu ka ha site nʼọmụma ụlọ ikwu ha kpọpụ onye ekpenta ọbụla maọbụ onye ihe si nʼahụ na-asọpụta, na ndị merụrụ onwe ha site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka.
NUM 5:3 Iwu a metụtara onye ọbụla, nwoke na nwanyị. Kpọpụ ha ka ha gaa nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ka ha ghara imerụ ogige ụlọ ikwu ha bụ ebe ahụ m binyere unu.”
NUM 5:4 Ndị Izrel mezuru iwu a, site nʼetiti ha kpọpụ ndị dị otu a, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
NUM 5:5 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 5:6 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla, nwoke maọbụ nwanyị, mejọrọ mmadụ ibe ya nʼụzọ ọbụla, si otu a bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ onye ikpe mara.
NUM 5:7 Onye dị otu a aghaghị ikwupụta mmehie ya, kwụghachi onye ahụ o mejọrọ ihe iwu kwuru na ọ ga-akwụ. Ọ ga-atụkwasị nʼelu ihe ọ na-akwụghachi onye ahụ o mejọrọ ego ọzọ ruru otu ụzọ nʼụzọ ise.
NUM 5:8 Ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị onye ikwu ya bụ onye a ga-akwụghachi ụgwọ nʼihi mejọọ ahụ, ihe ịkwụghachi ụgwọ ahụ ga-abụ nke Onyenwe anyị, aghaghị inye onye nchụaja. A ga-atụkwasịkwa ya ebule a ga-eji chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onye ahụ mehiere.
NUM 5:9 Onyinye niile dị nsọ ndị Izrel wetaara onye nchụaja bụ nke onye nchụaja ahụ.
NUM 5:10 Onyinye dị nsọ niile mmadụ na-eweta bụ nke onye na-eweta ya, ma onyinye e nyere onye nchụaja bụ nke onye nchụaja.’ ”
NUM 5:11 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
NUM 5:12 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, Ọ bụrụ na nwunye mmadụ ejehie ụzọ bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe di ya nọ
NUM 5:13 site nʼidinakwuru nwoke ọzọ nʼụzọ zoro ezo nʼebe di ya nọ ruo na achọpụtaghị adịghị ọcha ya (ebe a na-enweghị onye ga-agba akaebe megide ya, maọbụ na e jidere ya mgbe ọ na-akwa iko ahụ),
NUM 5:14 ọ bụrụ na mmụọ ekworo abịakwasị di ya, ọ bụrụkwa na di nwanyị ahụ na-enyo nwunye ya enyo, na-ele ya anya dịka onye merụrụ onwe ya, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na di ya esite nʼekworo nyoo nwunye ya, ọ bụ ezie na nwanyị ahụ bụ onye na-emerụghị onwe ya,
NUM 5:15 nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma.
NUM 5:16 “ ‘Onye nchụaja ga-akpọbata nwanyị a mee ka o guzo nʼihu Onyenwe anyị.
NUM 5:17 Ọ ga-ekunye mmiri nsọ nʼime ite aja, kporo aja nʼala site nʼụlọ nzute ahụ wụnye ya nʼime mmiri ahụ.
NUM 5:18 Dịka nwanyị ahụ guzo nʼihu Onyenwe anyị, onye nchụaja ahụ ga-atọsa agịrị isi ya, tinye onyinye mkpụrụ ọka ncheta ahụ, nke bụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ nʼọbụaka nwanyị a. Onye nchụaja nʼonwe ya ga-eguzo nʼihu nwanyị a jide ite mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ.
NUM 5:19 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi, mgbe ọ na-agwa ya okwu sị, “Ọ bụrụ na o nweghị nwoke ọbụla gị na ya nwere mmekọ, ọ bụrụ na ị kpafughị ghọọ onye na-adịghị ọcha mgbe ị nọ nʼụlọ di gị, ka ihe ọjọọ ọbụla ghara izute gị site na mmiri ilu a na-eweta ọbụbụ ọnụ.
NUM 5:20 Ma ọ bụrụ na ị kpafuola mgbe ị ka nọ nʼụlọ di gị, ọ bụrụ na i merụọla onwe gị site na idinakwuru nwoke ọzọ na-abụghị di gị,”
NUM 5:21 (nʼoge a, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi nke ya na ọbụbụ ọnụ a so, gwa nwanyị okwu sị ya) “ka Onyenwe anyị mee ka ndị ị nọ nʼetiti ha bụọ gị ọnụ ma kọchaa gị mgbe o mere ka apata gị ree ure, mgbe o mere ka afọ gị koo eko.
NUM 5:22 Ka mmiri ilu a, nke na-eweta ọbụbụ ọnụ banye gị nʼahụ ime ka afọ gị koo eko, imekwa ka akpanwa gị daa ada.” “ ‘Nwanyị ahụ ga-aza sị, “Amen, ya dịrị m otu a.”
NUM 5:23 “ ‘Mgbe ahụ onye nchụaja ahụ ga-ede ọbụbụ ọnụ ndị a nʼakwụkwọ, sanye ha nʼime mmiri ilu ahụ.
NUM 5:24 Mgbe ahụ, ọ ga-enye nwanyị a mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ ka ọ ṅụọ, mmiri a ga-abanye ya nʼime ahụ, wetara ya ịta ahụhụ dị ilu.
NUM 5:25 Emesịa, onye nchụaja ga-anara nwanyị ahụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ o ji nʼọbụaka ya, fegharịa ya nʼihu Onyenwe anyị, buru ya gaa nʼebe ịchụ aja.
NUM 5:26 Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ.
NUM 5:27 Ọ bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ọ ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ọ ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu, akpanwa ya a gaghị anagide nwa. Ọ ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya.
NUM 5:28 Ma ọ bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama ọ bụ onye dị ọcha, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. Ọ ga-atụrụ ime mụta ụmụ.
NUM 5:29 “ ‘Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya.
NUM 5:30 Maọbụ mgbe ekworo jupụtara nwoke nʼobi nʼihi na ọ gụrụ nwunye ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a guzo nʼihu Onyenwe anyị, mezuokwa ihe niile nʼusoro dịka e si depụta ha nʼebe a.
NUM 5:31 A gaghị ama di nwanyị a ikpe dịka onye mere ihe ọjọọ, kama nwanyị a ga-ebu ahụhụ ya na mmehie ya naanị ya.’ ”
NUM 6:1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
NUM 6:2 Gwa ndị Izrel sị ha, “Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ṅụrụ iyi o ji kpebie ikwe nkwa pụrụ iche nke ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait,
NUM 6:3 ha ga-ekewapụ onwe ha site na ịṅụ mmanya, maọbụ detụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya ire. Ha agaghị aṅụ mmiri mkpụrụ vaịnị, ọ gaghị ata mkpụrụ vaịnị ọhụrụ maọbụ nke a mịkpọrọ amịkpọ.
NUM 6:4 Oge ahụ niile ọ bụ onye Nazirait, ọ gaghị eri ihe ọbụla sitere na mkpụrụ osisi vaịnị maọbụ mkpụrụ ya maọbụ okpokoro azụ ya.
NUM 6:5 “ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too.
NUM 6:6 “ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, ọ gaghị aga nso mmadụ ọbụla nwụrụ anwụ,
NUM 6:7 ọ bụladị na nna ya, maọbụ nne ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị anwụọ. Ọ gaghị emerụ onwe ya nʼihi ha, nʼihi na akara ikewapụ onwe ya iche nye Chineke dị ya nʼisi.
NUM 6:8 Nʼoge niile nke ikewapụ onwe ya, onye e doro nsọ nye Onyenwe anyị ka ọ bụ.
NUM 6:9 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ na mberede nʼakụkụ onye nazirait, si otu a merụọ agịrị isi ya nke na-egosi ido nsọ ya, ọ ghaghị ịkpacha isi ya nʼụbọchị nke asaa bụ ụbọchị ime ka ọ dị ọcha.
NUM 6:10 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, bụ nʼụbọchị nke asatọ. Ọ ghaghị iwetara onye nchụaja nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
NUM 6:11 Onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ha chụọrọ ya aja mmehie. Ọ ga-ewerekwa nnụnụ nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ maka ikpuchiri onye ahụ nwere akara ido nsọ mmehie ya, bụ nke o mere site nʼịnọ onye nwụrụ anwụ nso. Ọ ga-edokwa isi ya nsọ ọzọ nʼụbọchị ahụ.
NUM 6:12 Ọ ga-ekewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka o mere na mmalite ụbọchị niile nke ido nsọ ya. Wetakwa otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja ikpe ọmụma. A gaghị agụnyere ya ụbọchị ndị ahụ niile gafere tupu o merụọ onwe ya, nʼihi na o merụrụ onwe ya mgbe ọ nọ ọnọdụ imezu nkwa nkewapụ.
NUM 6:13 “ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye Nazirait mgbe oge ido onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị zuru. A ga-eduru ya bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
NUM 6:14 Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ chee onyinye ya ndị a nʼihu Onyenwe anyị: nwa ebule na-enweghị ntụpọ, gbara otu afọ, maka aja nsure ọkụ na otu nwa nne atụrụ na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ maka aja mmehie, na otu ebule ahụ zuruoke maka aja udo,
NUM 6:15 tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ na otu nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na achịcha e ji ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ oliv mee, na achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e tere mmanụ oliv.
NUM 6:16 “ ‘Onye nchụaja ahụ ga-eche ihe aja ndị a niile nʼihu Onyenwe anyị, chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ.
NUM 6:17 Ọ ga-eji nwa ebule ahụ chụọ aja udo nye Onyenwe anyị, ya na nkata achịcha na-ekoghị eko ahụ. Ọ ga-achụkwa aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ.
NUM 6:18 “ ‘Mgbe ahụ, onye ahụ doro onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị ga-akpụchapụ agịrị isi ya nke bụ ihe na-egosi ido nsọ ya. Ọ ga-eme nke a na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Emesịa, ọ ga-etinye agịrị isi ahụ ọ kpụchapụtara nʼọkụ ahụ dị nʼokpuru aja udo ahụ.
NUM 6:19 “ ‘Mgbe a kpụchasịrị onye ahụ agịrị isi ya, nke na-egosi ido nsọ ya, onye nchụaja ga-ewere ubu aka ebule ahụ e sịrị esi, otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na otu mbadamba achịcha na-ekoghị eko site na nkata ahụ, tinye ha niile nʼaka onye ahụ.
NUM 6:20 Onye nchụaja ahụ nʼoge a, ga-ewere aja ndị a fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha niile ga-abụ ihe nsọ nye onye nchụaja ahụ, tinyere obi anụ ahụ e fufere efufe, na apata anụ ahụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ doro onwe ya nsọ nwere onwe ya ịṅụ mmanya.
NUM 6:21 “ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye ọ bụla kpebiri ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait. Onyinye onye ahụ ga-enye ga-abụ dịka nkwa ido nsọ ya si dị, tinyere ihe ndị ọzọ ha nwere ike inye. Onye dị otu a aghaghị imezu nkwa ọbụla o kwere dịka iwu metụtara onye Nazirait si dị.’ ”
NUM 6:22 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
NUM 6:23 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, ‘Otu a ka unu ga-esi gọzie ndị Izrel. Unu ga-asị ha,
NUM 6:24 “ ‘ “Onyenwe anyị gọzie unu ma chebe unu,
NUM 6:25 Onyenwe anyị mee ka ihu ya mụkwasị unu, ma meere unu amara,
NUM 6:26 Onyenwe anyị chee ihu ya nʼebe unu nọ, nyekwa unu udo.” ’
NUM 6:27 “Otu a ka ha ga-esi kwupụta aha m nye ụmụ Izrel. Mụ onwe m ga-agọzikwa ha.”
NUM 7:1 Mgbe Mosis guzobesiri ụlọ nzute ahụ ọtọ, o tere ya mmanụ. Doo ya na ihe niile e ji chọọ ya mma nsọ. O tekwara ebe ịchụ aja mmanụ, doo ya nsọ, ya na ngwongwo ya niile.
NUM 7:2 Mgbe ahụ, ndị ndu Izrel, ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndị ndu ebo niile e tinyere ọrụ ịgụ ndị ahụ niile ọnụ wetara onyinye ha.
NUM 7:3 Ha wetara dịka onyinye ha nye Onyenwe anyị ụgbọala isii ihe juputara nʼime ha, na ehi iri na abụọ. Ndị ndu abụọ ọbụla wetara otu ụgbọala, ma ha niile nʼotu na otu wetara otu ehi, otu ehi. Ha chere ihe ndị a niile nʼihu ụlọ nzute ahụ.
NUM 7:4 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 7:5 “Nabata onyinye ndị a niile, ka e jiri ha rụọ ọrụ ụlọ nzute, were ha nyefee ndị Livayị nʼaka, onye ọbụla dịka mkpa ọrụ ya si dị.”
NUM 7:6 Ya mere, Mosis nabatara ụgbọala ndị ahụ na ehi ndị ahụ, nyefee ha ndị Livayị nʼaka.
NUM 7:7 O nyere ụmụ Geshọn ụgbọala abụọ na ehi anọ, dịka ọrụ ha si dị.
NUM 7:8 Nye ụmụ Merari, ụgbọala anọ na ehi asatọ, dịka ọrụ ha si dị. Ha niile nọ nʼokpuru nlekọta Itama nwa Erọn, onye nchụaja.
NUM 7:9 Mosis enyeghị ụmụ Kohat ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ nʼisi mbụ aka ha ka ha ji ebu ihe nsọ ndị ahụ ha ketara ibu.
NUM 7:10 Ndị ndu ụmụ Izrel niile wetara onyinye ido nsọ nʼụbọchị e tere ebe ịchụ aja ahụ mmanụ ido ya nsọ. Ha wetara ha, debe ha nʼihu ebe ịchụ aja ahụ.
NUM 7:11 Nʼihi na Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ka onyendu ọbụla weta onyinye nʼụbọchị dị iche iche, otu onye, otu ụbọchị, maka ido nsọ nke ebe ịchụ aja ahụ.”
NUM 7:12 Ya mere, Nashọn nwa Aminadab onye si nʼebo Juda wetara onyinye nke ya nʼụbọchị nke mbụ.
NUM 7:13 Onyinye o wetara bụ: efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere abụọ ndị a ụtụ ọka a gwara mmanụ maka onyinye mkpụrụ ọka.
NUM 7:14 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
NUM 7:15 O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule nke gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
NUM 7:16 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
NUM 7:17 na ehi abụọ, na ebule ise, na mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Nashọn nwa Aminadab nyere.
NUM 7:18 Nʼụbọchị nke abụọ, Netanel nwa Zua, onyendu ebo Isaka wetara onyinye nke ya.
NUM 7:19 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
NUM 7:20 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
NUM 7:21 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
NUM 7:22 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
NUM 7:23 na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Netanel nwa Zua.
NUM 7:24 Nʼụbọchị nke atọ Eliab nwa Helọn onyendu ebo Zebụlọn wetakwara onyinye nke ya.
NUM 7:25 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
NUM 7:26 O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
NUM 7:27 O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
NUM 7:28 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
NUM 7:29 na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Eliab nwa Helọn wetara.
NUM 7:30 Nʼụbọchị nke anọ, Elizọ nwa Shedeua onyendu ebo Ruben wetara onyinye nke ya.
NUM 7:31 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
NUM 7:32 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
NUM 7:33 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
NUM 7:34 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
NUM 7:35 na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Elizọ nwa Shedeua nyere.
NUM 7:36 Nʼụbọchị nke ise Shelumiel nwa Zurishadai, onyendu ebo Simiọn butere onyinye nke ya.
NUM 7:37 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
NUM 7:38 O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
NUM 7:39 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
NUM 7:40 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
NUM 7:41 ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Shelumiel nwa Zurishadai nyere.
NUM 7:42 Nʼụbọchị nke isii, Eliasaf nwa Deuel onyendu ebo Gad butere onyinye nke ya.
NUM 7:43 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
NUM 7:44 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
NUM 7:45 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
NUM 7:46 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
NUM 7:47 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Eliasaf nwa Deuel nyere.
NUM 7:48 Nʼụbọchị nke asaa, Elishama, nwa Amihud, onyendu ebo Ifrem butere onyinye nke ya.
NUM 7:49 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
NUM 7:50 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
NUM 7:51 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
NUM 7:52 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
NUM 7:53 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Elishama nwa Amihud nyere.
NUM 7:54 Nʼụbọchị nke asatọ, Gamaliel nwa Pedazo onyendu ebo Manase nyere onyinye nke ya.
NUM 7:55 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
NUM 7:56 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
NUM 7:57 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
NUM 7:58 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
NUM 7:59 ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Gamaliel nwa Pedazo nyere.
NUM 7:60 Nʼụbọchị nke itoolu, Abidan nwa Gidiọn onyendu ebo Benjamin nyere onyinye nke ya.
NUM 7:61 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
NUM 7:62 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
NUM 7:63 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
NUM 7:64 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
NUM 7:65 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Abidan nwa Gidiọni nyere.
NUM 7:66 Nʼụbọchị nke iri, Ahieza nwa Amishadai, onyendu ebo Dan butere onyinye nke ya.
NUM 7:67 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
NUM 7:68 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
NUM 7:69 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
NUM 7:70 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
NUM 7:71 ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Ahieza nwa Amishadai nyere.
NUM 7:72 Nʼụbọchị nke iri na otu, Pagịel nwa Okran, onyendu ebo Asha butere onyinye nke ya.
NUM 7:73 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
NUM 7:74 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
NUM 7:75 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
NUM 7:76 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
NUM 7:77 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Pagịel nwa Okran nyere.
NUM 7:78 Nʼụbọchị nke iri na abụọ, Ahira nwa Enan, onyendu ebo Naftalị nyere onyinye nke ya.
NUM 7:79 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
NUM 7:80 O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
NUM 7:81 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
NUM 7:82 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
NUM 7:83 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Ahira nwa Enan nyere.
NUM 7:84 Ndị a bụ onyinye ndị ndu ụmụ Izrel wetara maka ido ebe ịchụ aja nsọ nʼoge e tere ya mmanụ: efere ọlaọcha iri na abụọ, na efere ọlaọcha ịkwọsa mmiri iri na abụọ, na efere ọlaedo iri na abụọ.
NUM 7:85 Ịdị arọ nke efere ọlaọcha ọbụla dị otu narị shekel na iri shekel atọ. Ịdị arọ nke efere ịkwọsa mmiri ọbụla dị iri shekel asaa. Ịdị arọ efere ọlaọcha niile ha wetara bụ puku shekel abụọ na narị shekel anọ, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị.
NUM 7:86 Ịdị arọ nke otu nʼime efere ọlaedo iri na abụọ ndị ahụ ụda nsure ọkụ na-esi isi ụtọ juru nʼime ha bụ iri shekel, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. Ịdị arọ nke efere ọlaedo ndị ahụ niile bụ otu narị shekel na iri shekel abụọ.
NUM 7:87 Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile e wetara maka aja nsure ọkụ bụ: oke ehi iri na abụọ, na ebule iri na abụọ, na ụmụ ebule iri na abụọ gbara otu afọ, otu afọ, tinyere ihe niile ha wetara maka aja mkpụrụ ọka. E ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie.
NUM 7:88 Anụ ụlọ niile e ji chụọ aja udo bụ, iri oke ehi abụọ na anọ, na iri ebule isii, na iri mkpi isii, na ụmụ ebule iri isii ndị gbara naanị otu afọ, otu afọ. Ndị a niile bụ onyinye e nyere maka ido ebe ịchụ aja nsọ nʼoge e tere ya mmanụ.
NUM 7:89 Mgbe Mosis banyere nʼụlọ ikwu ahụ ka ya na Onyenwe anyị kparịa ụka, ọ nụrụ olu ahụ ka ọ na-agwa ya okwu site nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ nʼelu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ gwa ya okwu. Nʼụzọ dị otu a ka Onyenwe anyị si gwa ya okwu.
NUM 8:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 8:2 “Gwa Erọn okwu sị ya, ‘Mgbe ọbụla ị mụnyere oriọna asaa nke iheọkụ, ị ga-edozi ha ka ìhè ha na-enwupụta naanị nʼihu iheọkụ ahụ.’ ”
NUM 8:3 Erọn mere otu a. O doziri oriọna ndị ahụ ka ha chee ihu nʼihe ịdọba oriọna, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
NUM 8:4 Otu a ka esi mee ihe ịdọba oriọna ahụ. Ọ bụ naanị ọlaedo ka e ji kpụọ iheọkụ ahụ, site nʼụkwụ ya ruo nʼokooko niile e ji chọọ ya mma. A kpụrụ iheọkụ ahụ nʼusoro dịka oyiyi Onyenwe anyị gosiri Mosis si dị.
NUM 8:5 Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
NUM 8:6 “Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel, kpọpụta ụmụ Livayị, doo ha iche, mee ha ka ha dịrị ọcha.
NUM 8:7 Ime ka ha dị ọcha, lee ihe ị ga-eme. Fesa ha mmiri na-asachapụ mmehie. Hụkwa na ha kpụchapụrụ ajị niile dị ha nʼahụ, ma sachaa uwe ha. Si otu a mee ka ha bụrụ ndị dị ọcha.
NUM 8:8 Gwa ha ka ha weta nwa oke ehi na onyinye mkpụrụ ọka, bụ ụtụ ọka a gwara mmanụ. Ha ga-ewetakwa nwa oke ehi ọzọ; ka ọ bụrụ ihe ha ji achụ aja mmehie.
NUM 8:9 Emesịa, kpọbata ụmụ Livayị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Meekwa ka ọgbakọ ndị Izrel niile zukọọ nʼebe ahụ.
NUM 8:10 Kpọpụta ndị Livayị nʼihu Onyenwe anyị, ma mee ka ndị Izrel niile bikwasị ha aka ha.
NUM 8:11 Mgbe ahụ, Erọn ga-ewere ndị Livayị chee Onyenwe anyị nʼihu dịka onyinye mfufe ndị Izrel niile na-enye ya. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ Livayị niile ga-abụ ndị jikere ijere Onyenwe anyị ozi.
NUM 8:12 “Emesịa, ndị Livayị ga-abịa bikwasị aka ha nʼisi oke ehi abụọ ndị ahụ jiri otu nʼime oke ehi abụọ ndị ahụ chụọ aja mmehie nye Onyenwe anyị, jiri nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ, maka ikpuchi mmehie ndị Livayị.
NUM 8:13 Mgbe ahụ, mee ka ndị Livayị guzo nʼihu Erọn na ụmụ ndị ikom, werekwa ha nyefee Onyenwe anyị nʼaka dịka a ga-asị na ha bụ onyinye mfufe a na-enye Onyenwe anyị.
NUM 8:14 Otu a ka ị ga-esi doo ndị Livayị nsọ ime ka ha dịrị iche site nʼigwe ụmụ Izrel ndị ọzọ. Ọ bụ m nwe ndị Livayị.
NUM 8:15 “Mgbe i dosiri ndị Livayị nsọ, cheekwa ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe, ha ga-abịa nʼime ụlọ nzute ahụ ije ozi dịrị ha.
NUM 8:16 Ha bụ nke m site nʼetiti ụmụ Izrel niile. Anarala m ha ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ, nwa nwoke nke nwanyị ọbụla nʼIzrel.
NUM 8:17 Nʼihi na nwa nwoke mbụ ọbụla a mụrụ nʼetiti ndị Izrel bụ nke m, ma mmadụ ma anụmanụ niile. Edoro m ha nsọ nye onwe m, site nʼabalị ụbọchị ahụ m tigbusiri ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ nʼIjipt.
NUM 8:18 Ewerela m ndị Livayị nʼọnọdụ ụmụ nwoke mbụ niile a mụrụ nʼIzrel.
NUM 8:19 Site nʼetiti ndị Izrel niile, ewerela m ndị Livayị nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom dịka onyinye, ka ha rụọ ọrụ niile dị nʼime ụlọ nzute ahụ nʼọnọdụ ụmụ Izrel. Ka ha kpuchiere ha mmehie ha niile ka ihe otiti nke nrịa nrịa ghara ịbịakwasị ụmụ Izrel, mgbe ọbụla ha bịara nso ebe nsọ ahụ.”
NUM 8:20 Ya mere, Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel chere ụmụ Livayị nʼihu Onyenwe anyị, nʼusoro dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
NUM 8:21 Ndị Livayị niile doro onwe ha ọcha, sachakwaa uwe ha niile. Erọn chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye aja mfufe, chụọrọ ha aja ikpuchi mmehie, ime ka ha dị ọcha.
NUM 8:22 Nʼikpeazụ, ndị Livayị bịara ije ozi ha nʼụlọ nzute nʼokpuru Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Ha nyekwara ndị Livayị ọrụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
NUM 8:23 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 8:24 “Iwu m ndị a metụtara ndị Livayị niile. Nwoke onye Livayị ọbụla ga-ebido ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute m mgbe ọ gbara iri afọ abụọ na ise.
NUM 8:25 Ọ ga-akwụsịkwa ịrụ ọrụ nʼime ya mgbe ọ gbara iri afọ ise, mgbe oge ezumike ọrụ ya ga-amalite.
NUM 8:26 Ha nwere ike inyere ụmụnne ha aka nʼịrụ ọrụ ha nʼime ụlọ nzute, ma ha onwe ha agaghị arụ ọrụ ahụ. Otu a ka ị ga-esi dozie ọrụ ije ozi nke ndị Livayị.”
NUM 9:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ndị a nʼọzara Saịnaị nʼọnwa mbụ nʼafọ nke abụọ site nʼoge ha hapụrụ ala Ijipt. Ọ sịrị ya,
NUM 9:2 “Gwa ụmụ Izrel ka ha mee Mmemme Ngabiga nʼoge a kara aka.
NUM 9:3 Ha mee ya nʼoge a kara aka, malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa a. Ha ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e ji eme ya si dị.”
NUM 9:4 Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel sị ha mee Mmemme Ngabiga.
NUM 9:5 Ha mekwara ya nʼọzara Saịnaị malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. Ndị Izrel mere ihe niile nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
NUM 9:6 Ma ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel esoghị mee Mmemme Ngabiga ahụ nʼihi na ha rụrụ arụ site nʼịnọ ozu nso. Nʼihi ya, ha bịakwutere Mosis na Erọn nʼụbọchị ahụ,
NUM 9:7 sị Mosis, “Anyị ghọrọ ndị rụrụ arụ nʼihi ịnọ ozu mmadụ nso. Gịnị ga-egbochi anyị iso ndị Izrel ndị ọzọ iwetara Onyenwe anyị onyinye nʼoge a kara aka?”
NUM 9:8 Mosis zara sị ha, “Cherenụ ka m ga jụta Onyenwe anyị ihe bụ uche ya banyere mkpa unu.”
NUM 9:9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
NUM 9:10 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na e nwee onye Izrel ọbụla nke merụrụ onwe ya nʼoge Mmemme Ngabiga site nʼịnọ ozu mmadụ nso, maọbụ site nʼịnọ nʼije, ha nwekwara ike iso mee Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.
NUM 9:11 Kama ha ga-eme ya nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa abụọ. Ha ga-eri nwa atụrụ ha, achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ilu.
NUM 9:12 Ha agaghị erifọ ihe ọbụla nʼime ya ruo chi ọbụbọ ụbọchị so ya. Ha agaghị agbaji ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ. Mgbe ha mere Mmemme Ngabiga, ha ga-esorokwa ụzọ niile e si eme mmemme ahụ mee nke ha.
NUM 9:13 Ma ọbụla nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha, onye nke na-anọghị nʼije nʼoge Mmemme Ngabiga ma kpachapụrụ anya hapụ isoro ndị ọzọ nʼoge mmemme a, a ga-ewezuga ya site nʼetiti ụmụ Izrel niile, nʼihi na ọ jụrụ iwetara Onyenwe anyị onyinye nʼoge a kara aka. Onye dị otu a ga-ebu ahụhụ mmehie ya nʼisi ya.
NUM 9:14 “ ‘Onye ọbịa bi nʼetiti unu chọrọ iso na Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị, ọ ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e nyere si dị. Unu ga-enwe otu iwu ahụ nye onye amụrụ nʼala na mbịarambịa.’ ”
NUM 9:15 Nʼụbọchị ahụ e guzobere ụlọ nzute ahụ bụ ụlọ ikwu nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, igwe ojii kpuchiri ya. Site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ igwe ojii ahụ dị nʼelu ụlọ nzute ahụ dịka ọkụ nʼile anya.
NUM 9:16 Otu a ka ọ dịgidere mgbe niile. Igwe ojii kpuchigidere ya, ma nʼabalị ọ na-acha dị ka ọkụ.
NUM 9:17 Mgbe ọ bụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, ụmụ Izrel na-ebuli njem, ma mgbe ọbụla igwe ojii ahụ na-anọgide, ha na-anọgidekwa.
NUM 9:18 Mgbe Onyenwe anyị nyekwara iwu, ha na-akwụsị, maa ụlọ ikwu ha. Oge niile igwe ojii nọgidere nʼelu ụlọ nzute ahụ ka ụmụ Izrel na-anọgidekwa nʼụlọ ikwu ha.
NUM 9:19 Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọọtee anya, ụmụ Izrel nʼonwe ha na-erube isi nʼiwu Onyenwe anyị hapụ ịga nʼihu nʼije ha.
NUM 9:20 Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị abalị ole na ole. Dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ha na-ama ụlọ ikwu ha, maọbụ bulie njem ha.
NUM 9:21 Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Mgbe o si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie nʼụtụtụ, ụmụ Izrel na-ebuli njem ha. Ọ bụrụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ biliri, ụmụ Izrel na-ebuli njem ha.
NUM 9:22 Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọdụ nʼelu ụlọ nzute ahụ abalị abụọ, maọbụ otu ọnwa, maọbụ otu afọ, ụmụ Izrel na-anọgide nʼụlọ ikwu ha. Ma ngwangwa igwe ojii ahụ biliri, ha onwe ha na-ebulikwa njem ha.
NUM 9:23 Site nʼiwu Onyenwe anyị na-enye, ha na-ama ụlọ ikwu ha, sitekwa nʼiwu Onyenwe anyị nyere ha, ha na-ebili njem. Ha mere ihe niile Onyenwe anyị kwuru nʼusoro dịka iwu o nyere ha site nʼọnụ Mosis si dị.
NUM 10:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
NUM 10:2 “Kpụọ opi ọlaọcha abụọ, jiri ha na-akpọ mkpọkọta nzukọ ụmụ Izrel na ime ka ha mara mgbe mbuli ije nke ọmụma ụlọ ikwu ruru.
NUM 10:3 Mgbe a fụrụ opi abụọ ahụ, nzukọ Izrel niile ga-ezukọta nʼihu gị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
NUM 10:4 Ma ọ bụrụ naanị otu opi ka a fụrụ, ọ bụ ndị ndu, ndịisi ikwu Izrel niile ga-ezukọta bịakwute gị.
NUM 10:5 Otu ụda opi ike ga-egosi na ebo Izrel niile mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebuli ije.
NUM 10:6 Opi ike ahụ daa ụda nke ugboro abụọ, ọ na-egosi na ndị mara ụlọ ikwu ha na ndịda ga-ebuli ije. Ịda ụda nke opi ike bụ ihe e ji amata na oge ibuli ije eruola.
NUM 10:7 Mgbe a ga-akpọkọta ndị Izrel niile a ga-egbu opi, kama ụda ya ga-adị iche.
NUM 10:8 “Ọ bụ naanị ụmụ ndị ikom Erọn, ndị nchụaja ga-egbu opi ndị a. Nke a bụ iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile.
NUM 10:9 Mgbe unu gara ibu agha nʼala unu imegide onye iro na-akpagbu unu, fụọnụ opi ike. Nke a ga-eme ka Onyenwe anyị Chineke unu cheta unu, ma napụta unu site nʼaka ndị iro unu.
NUM 10:10 Unu ga-egbukwa opi ndị a nʼoge aṅụrị, nʼoge mmemme unu a kara aka, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ niile. Gbukwaanụ opi mgbe unu na-achụ aja nsure ọkụ unu, na aja udo unu niile. Ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta unu nʼihu Chineke unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”
NUM 10:11 Nʼụbọchị iri abụọ, nʼime ọnwa nke abụọ, nʼafọ nke abụọ, igwe ojii ahụ biliri site nʼelu ụlọ nzute nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
NUM 10:12 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel biliri ije site nʼọzara Saịnaị jegharịa site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu igwe ojii ahụ akwụsị nʼọzara Paran.
NUM 10:13 Nke a bụ njem mbụ ha mere dịka Onyenwe anyị si nye Mosis iwu banyere ije ha.
NUM 10:14 Usuu ọmụma ụlọ ikwu nke ebo Juda buru ụzọ bulie ije a, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Nashọn, nwa Aminadab, bụ onyendu ha.
NUM 10:15 Netanel nwa Zua bụ onyendu usuu ebo Isaka.
NUM 10:16 Eliab nwa Helọn bụ onyendu usuu ebo Zebụlọn
NUM 10:17 Mgbe ahụ, e wedara ụlọ nzute ahụ. Ụmụ Geshọn na Merari buru ya, bilikwaa ije ha.
NUM 10:18 Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ruben biliri ije, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elizọ nwa Shedeua bụ onyendu ha.
NUM 10:19 Shelumiel nwa Zurishadai bụ onyendu usuu ebo Simiọn.
NUM 10:20 Eliasaf nwa Deuel bụ onyendu usuu ebo Gad.
NUM 10:21 Mgbe ahụ, ụmụ Kohat ndị bu ihe nsọ ndị ahụ niile, biliri ije ha. Tutu ha erute, e guzobere ụlọ nzute ahụ nʼebe o kwesiri ịdị.
NUM 10:22 Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ifrem biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elishama nwa Amihud bụ onyendu ha.
NUM 10:23 Gamaliel nwa Pedazo bụ onyendu usuu ebo Manase.
NUM 10:24 Abidan nwa Gidiọni bụ onyendu usuu ebo Benjamin.
NUM 10:25 Na ngwụsị usoro ahụ, usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Dan biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai.
NUM 10:26 Pagịel nwa Okran bụ onyendu usuu ebo Asha.
NUM 10:27 Ahira nwa Enan bụ onyendu usuu ebo Naftalị.
NUM 10:28 Nke a bụ usoro usuu ụmụ Izrel si bilie ije ha.
NUM 10:29 Mosis gwara Hobab nwa Reuel, nna nwunye ya onye Midia okwu sị, “Anyị ebiliela ije ịga ebe ahụ Onyenwe anyị gwara anyị sị, ‘Aga m enye unu.’ Bịa ka ị soro anyị. Anyị ga-emezi gị nke ọma nʼihi na Onyenwe anyị ekwela Izrel nkwa ọtụtụ ezi ihe.”
NUM 10:30 Ma ọ zara sị, “E e, agaghị m eso unu. Ana m alaghachi nʼala nke aka m ịlaghachikwuru ụmụnna m.”
NUM 10:31 Ma Mosis zara sị ya, “Biko ahapụla anyị nʼihi na ị maara ebe anyị nwere ike kwụsị zuo ike nʼọzara. Ị ga-abụrụ anyị anya anyị ji ahụ ụzọ.
NUM 10:32 Ọ bụrụ na i soro anyị, anyị ga-ekenye gị ihe ọma ọbụla Onyenwe anyị ga-enye anyị.”
NUM 10:33 Ya mere ha sitere nʼugwu Onyenwe anyị bilie ije. Jeekwa ije abalị atọ. Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-aga ha nʼihu ụbọchị atọ ndị ahụ niile ịchọtara ha ebe ha ga-akwụsị zuo ike.
NUM 10:34 Igwe ojii Onyenwe anyị dị nʼelu ha nʼehihie mgbe ha si nʼọmụma ụlọ ikwu ha bilie ije.
NUM 10:35 Mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ ahụ biliri ije, Mosis na-ekwu sị, “Bilie O Onyenwe anyị, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị; ka ndị iro gị niile site nʼihu gị gbalaga.”
NUM 10:36 Ma mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ bịara ebe izuike, Mosis na-ekwukwa sị, “Lọghachi O Onyenwe anyị, bịakwute ọtụtụ mmadụ ndị a, bụ imerime puku ndị Izrel.”
NUM 11:1 Mgbe na-adịghị anya ụmụ Izrel bidoro itamu ntamu nʼihi ihe ike niile ha na-ezute nʼije ha. Ma ntamu a ruru Onyenwe anyị ntị. Nʼihi ya, Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide ha. Ọkụ sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ, ree nʼetiti ha, repịa ụfọdụ ndị bi nʼakụkụ ngwụsị ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
NUM 11:2 Mgbe nke a mere, ụmụ Izrel tikuru Mosis mkpu akwa. Mosis kpere ekpere nye Onyenwe anyị nʼihi ha, ọkụ ahụ kwụsịkwara.
NUM 11:3 Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Tabera, nʼihi ọkụ ahụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ ree nʼetiti ha.
NUM 11:4 Ndị amakekwu so ụmụ Izrel nʼije a malitere itamu ntamu banyere nri ndị ọzọ na-agụ ha agụụ. Nke a mere ka ụmụ Izrel malite ịkwa akwa, na-asị, “A sịkwarị na anyị nwere anụ anyị ga-ata.
NUM 11:5 Anyị chetara azụ anyị tara nʼIjipt, nke na-adịghị efu anyị ego, ya na kukumba, na melọn, na liik, na ayo na galiik.
NUM 11:6 Ma ugbu a, anyị enweghịkwa agụụ iri nri, nʼihi na site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọ bụ naanị mánà bụ ihe oriri anyị nwere.”
NUM 11:7 Mánà dịka mkpụrụ kọrianda, na-acha ka eso osisi kpọrọ nkụ.
NUM 11:8 Ndị Izrel na-ejegharị na-achịkọta ha. Emesịa, ha na-eji nkume e ji akwọ nri na-akwọri ha. Oge ụfọdụ, ha na-eji ikwe nri sụọ ya. Emesịa, ha na-esi ya esi, maọbụ ghee ya eghe. Ọ na-atọ dịka ihe e ji mmanụ oliv ghee.
NUM 11:9 Mánà ndị a na-ada mgbe igirigi dara nʼọmụma ụlọ ikwu nʼabalị.
NUM 11:10 Mosis nụrụ mkpu akwa ụmụ Izrel niile, nke na-ada nʼezinaụlọ ọbụla nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha. Iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu. Otu a kwa, obi jọrọ Mosis njọ nke ukwuu.
NUM 11:11 Mosis jụrụ Onyenwe anyị sị, “Gịnị mere i ji bokwasị ohu gị nsogbu dị otu a nʼisi? Gịnị ka m mere na m ahụtakwaghị amara nʼebe ị nọ, nke mere i ji bukwasị m ibu arọ nke ilekọta ndị a?
NUM 11:12 Ọ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ bụ m mụrụ ha? Gịnị mere i ji si m kuru ha nʼaka m gawa nʼala ahụ ị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha, dịka m bụ nne nwa na-ekugharị nwantakịrị?
NUM 11:13 Ebee ka m ga-achọta anụ ga-ezuru igwe mmadụ ndị a? Lee na ha na-akwasa m akwa na-asị m, ‘Nye anyị anụ!’
NUM 11:14 Agaghị m ebulite ibu ịchịkọta ndị a niile nʼonwe m! Ibu a dị m arọ nke ukwuu.
NUM 11:15 Ọ bụrụ na ị ga-esi otu a meso m mmeso, biko napụ m ndụ m ugbu a, nʼihi na ọnwụ m ga-egosi na m natara amara nʼebe ị nọ. Site nʼọnọdụ a ga-ewetara m mbibi wezuga m.”
NUM 11:16 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpọkọta iri ndị okenye ụmụ Izrel asaa, ndị ị maara na ha bụ ndị ndu, na ndị nlekọta ije ozi nʼetiti ụmụ Izrel. Kpọta ha nʼụlọ nzute m ka ha soro gị guzoro.
NUM 11:17 Aga m abịa nʼebe ahụ gwa gị okwu. Mgbe ahụ kwa, aga m ewere ụfọdụ nʼime Mmụọ m dị nʼime gị tinye nʼime iri ndị ndu asaa ahụ. Ha ga-enyere gị aka ibu ibu arọ nke ịchịkọta ụmụ Izrel. Nʼụzọ dị otu a, ọ gaghị abụkwa ibu dịrị naanị gị ibu.
NUM 11:18 “Ugbu a, gwa ndị Izrel niile si ha, ‘Doonụ onwe unu nsọ, kwadoonụ maka echi, mgbe unu ga-ata anụ. Onyenwe anyị nụrụ mgbe unu kwara akwa sị, “A sịkwa na anyị nwere anụ anyị ga-ata. Ihe dịrị anyị mma nʼIjipt karịa otu ọ dị ugbu a.”
NUM 11:19 Anụ unu ga-eri abụghị naanị nke otu ụbọchị, maọbụ ụbọchị abụọ, maọbụ ụbọchị ise, maọbụ iri, ma ọ bụkwanụ iri ụbọchị abụọ!
NUM 11:20 Kama unu ga-eri ya otu ọnwa zuru ezu, ruo mgbe ọ ga-esi unu nʼimi sọpụta, ghọrọ unu ihe ịsọ oyi. Nʼihi na unu ajụla Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti unu, kwaa akwa nʼihu ya, sị, “Gịnị mere anyị ji site nʼala Ijipt pụta?” ’ ”
NUM 11:21 Ma Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Ọnụọgụgụ ndị ikom dị narị puku isii ndị ji ụkwụ eje ka m nọ nʼetiti ha, ma ị na-asị, ‘Aga m enye ha anụ otu ọnwa.’
NUM 11:22 Ọ ga-ezuru ha ma ọ bụrụ na e gbuoro ha igwe ehi na atụrụ? Ọ bụ azụ niile nke dị nʼoke osimiri ga-ezuru ha ma egbuo ha niile nye ha?”
NUM 11:23 Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Aka Onyenwe anyị ọ dị mkpụmkpụ? Ugbu a, ị ga-ahụ ma m ga-emezu okwu m, maọbụ na m agaghị emezu ya.”
NUM 11:24 Ya mere, Mosis pụrụ ga gwa ụmụ Izrel ihe Onyenwe anyị kwuru. Ọ chịkọtara iri ndị okenye asaa ahụ nye ha ọnọdụ gburugburu ụlọ nzute ahụ.
NUM 11:25 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii. Ya na Mosis kparịtaa ụka. Onyenwe anyị weere ụfọdụ nʼime Mmụọ dị nʼime Mosis, tinye ya nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ. Mgbe Mmụọ a batara nʼime ha, ha niile buru amụma. Ma ha ebughị amụma gaa nʼihu.
NUM 11:26 Ma mmadụ abụọ nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ, Eldad na Medad nọgidere nʼọmụma ụlọ ikwu ha. Ọ bụ ezie na e depụtara aha ha dịka ndị ndu, ma ha esoghị ndị ọzọ gaa nʼụlọ nzute. Ma Mmụọ ahụ bịakwasịrị ha nʼebe ahụ ha nọ. Ha bukwara amụma.
NUM 11:27 Otu okorobịa gbapụrụ ọsọ gaa kọọrọ Mosis sị ya, “Eldad na Medad na-ebu amụma nʼọmụma ụlọ ikwu ha.”
NUM 11:28 Joshua nwa Nun, onyeozi Mosis site na mgbe ọ bụ okorobịa, gwara Mosis okwu sị ya, “Onyenwe m Mosis, mee ka ndị a kwụsị ibu amụma.”
NUM 11:29 Ma Mosis zara sị, “Ọ bụ nʼihi ikwochitara m ekworo ka i ji chọọ ka m kwụsị ha? Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na ndị Onyenwe anyị niile bụ ndị amụma, ndị Onyenwe anyị ga-etinye Mmụọ ya nʼime ha!”
NUM 11:30 Mgbe ahụ Mosis na ndị okenye Izrel ndị ahụ niile lọghachiri nʼebe ụlọ ikwu ha dị.
NUM 11:31 Otu oke ifufe sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ bịa si nʼosimiri bute ọtụtụ nnụnụ a na-akpọ kweel. O mere ka nnụnụ ndị a daa nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha, nʼime ogige ya niile. Nnụnụ ndị a fere ihe dịka otu mita site nʼelu ala, nʼakụkụ niile, ruo nʼebe mmadụ pụrụ iji ụkwụ jeruo nʼotu ụbọchị. Ha jupụtakwara ebe niile.
NUM 11:32 Ya mere ndị Izrel biliri ụbọchị ahụ niile, na nʼabalị ahụ niile, na echi ya niile pụọ ịchịkọta nnụnụ kweel ndị a! Onye gbutere nke nta gbutezuru ihe ọtụtụ homa iri. Ha gbasara ha akụkụ niile nke ogige ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
NUM 11:33 Ma mgbe anụ ndị a ka dị ha nʼọnụ, Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide ha. O tiri ha nrịa nrịa na-efe efe.
NUM 11:34 Nʼihi nke a, a kpọrọ aha ebe ahụ Kibrọt Hataava, nʼihi na nʼebe ahụ ka e liri ndị Izrel nwụrụ nʼihi oke ọchịchọ nri.
NUM 11:35 Site na Kibrọt Hataava, ndị Izrel biliri njem rute Hazerọt ebe ha nọrọ.
NUM 12:1 Miriam na Erọn malitere ikwu okwu megide Mosis, nʼihi na ọ lụrụ nwunye onye Kush.
NUM 12:2 Ha kwuru sị, “Ọ bụ naanị site nʼọnụ Mosis ka Onyenwe anyị si agwa ndị ya okwu? Ọ naghị esitekwa nʼọnụ anyị kwuo okwu?” Onyenwe anyị nụrụ ihe ndị a ha kwuru.
NUM 12:3 (Ma nwoke ahụ bụ Mosis dị umeala nʼobi nke ukwuu karịa onye ọbụla nọ nʼelu ala.)
NUM 12:4 Na mberede, Onyenwe anyị sịrị Mosis, na Erọn, na Miriam, “Pụtanụ, bịa nʼụlọ nzute, unu mmadụ atọ” Ya mere ha atọ pụtara.
NUM 12:5 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii, guzoro na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, kpọpụta Erọn na Miriam. Mgbe ha abụọ bịara nso.
NUM 12:6 Onyenwe anyị gwara ha sị, “Geenụ ntị nʼokwu m ndị a: “Mgbe onye amụma nọ nʼetiti unu, Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-egosi ya onwe m site nʼọhụ. Ana m agwa ya okwu site na nrọ.
NUM 12:7 Ma nʼebe ohu m Mosis nọ, o sighị otu a dịrị, ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼụlọ m niile.
NUM 12:8 Nʼebe ọ nọ, ana m agwa ya okwu ihu na ihu nʼụzọ doro anya, ọ bụghị site nʼilu, ọ na-ahụkwa ụdịdị Onyenwe anyị. Gịnị mere ụjọ atụghị unu ikwu okwu megide ohu m Mosis?”
NUM 12:9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha. O si nʼebe ha nọ pụọ.
NUM 12:10 Ma mgbe igwe ojii ahụ hapụrụ ụlọ nzute ahụ, lee Miriam ebe o guzo, ekpenta tiwapụtara ya nʼahụ dịka nzu ọcha. Mgbe Erọn tụgharịrị ebe ọ nọ hụ na ọ ghọọla onye ekpenta,
NUM 12:11 ọ gwara Mosis okwu sị, “Biko, onyenwe m, atala anyị ahụhụ nʼihi mmehie anyị sitere na nzuzu mee.
NUM 12:12 Ekwela ka Miriam dịrị ka nwa ọhụrụ nwụrụ anwụ nke akpụkpọ ahụ ya rere ure nʼoge o si nʼakpanwa nne ya na-apụta.”
NUM 12:13 Ya mere Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị ya, “Chineke, biko, gwọọ ya!”
NUM 12:14 Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya, “Ọ bụrụ na nna ya gbụrụ ya asụ nʼihu, ọ gaghị abụ onye rụrụ arụ abalị asaa? Ya mere, hapụ ya ka ọ bụrụ onye e sitere nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel wezuga abalị asaa. Mgbe oge a gafesịrị, o nwere ike ịlọghachi.”
NUM 12:15 Ya mere e wezugara Miriam site nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel abalị asaa. Ndị Izrel niile nọdụrụ chere ya ruo mgbe ọ lọghachiri, tutu ha ebilie nʼije ọzọ.
NUM 12:16 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha hapụrụ Hazerọt rute nʼọzara Paran ebe ha wuru ogige ụlọ ikwu ha.
NUM 13:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 13:2 “Ziga ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa legharịa anya nʼala Kenan, ala ahụ m na-enye Izrel. Ziga mmadụ iri na abụọ, otu onyendu site nʼebo Izrel ọbụla.”
NUM 13:3 Ya mere, dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị, Mosis zipụrụ ha site nʼọzara Paran. Ha niile bụ ndị ndu nʼetiti ụmụ Izrel.
NUM 13:4 Nke a bụ aha ha: Site nʼebo Ruben, Shamua nwa Zakua,
NUM 13:5 Shafat nwa Hori, onye si nʼebo Simiọn.
NUM 13:6 Kaleb nwa Jefune, onye si nʼebo Juda.
NUM 13:7 Igal nwa Josef, onye si nʼebo Isaka.
NUM 13:8 Hoshea nwa Nun, onye si nʼebo Ifrem
NUM 13:9 Palti nwa Rafu, onye si nʼebo Benjamin.
NUM 13:10 Gadiel nwa Sodi, onye si nʼebo Zebụlọn.
NUM 13:11 Gadi nwa Susi, onye sitere nʼebo Manase (ya bụ ebo Josef).
NUM 13:12 Amiel nwa Gemali, onye si nʼebo Dan.
NUM 13:13 Setua nwa Maikel, onye si nʼebo Asha.
NUM 13:14 Nabi nwa Vofusi, onye si nʼebo Naftalị.
NUM 13:15 Geuel nwa Maki, onye si nʼebo Gad.
NUM 13:16 Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ Mosis zipụrụ inyocha ala ahụ. (Ọ bụ nʼoge a ka Mosis gbanwere aha Hoshea nwa Nun, ka ọ bụrụ Joshua.)
NUM 13:17 Mosis zipụrụ ha ịga ledoo ala Kenan, ọ sịrị, “Gbagoonụ site nʼụzọ Negev gakwanụ nʼala ugwu ugwu.
NUM 13:18 Letanụ otu ala ahụ dị. Chọpụtanụ ụdị ndị bi nʼime ya, ma ha dị ike ma ha bụ ndị na-adịghị ike, ma ha dị ọtụtụ ma ha dị ole na ole.
NUM 13:19 Letanụ ụdị ala ha bi nʼime ya, ma ọ dị mma ma ọ jọrọ njọ. Chọpụtanụ ụdị obodo dị nʼebe ahụ, ma ha bụ obodo mgbidi na-adịghị gburugburu ha, ma ha bụ obodo e wusiri ike.
NUM 13:20 Letanụ otu ala ahụ dị. Ọ na-epupụta ihe ka ọ bụ ala ụkpa? Letanụ ma ha nwere ọtụtụ osisi ka ọ bụ na osisi adịghị nʼime ya. Gbalịanụ ka unu weta ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi dị nʼala ahụ.” (Ọ bụ oge mkpụrụ mbụ nke osisi vaịnị.)
NUM 13:21 Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat.
NUM 13:22 Ha gara site na Negev rute Hebrọn, ebe Ahiman na Sheshai na Talmai, ụmụ ụmụ Anak bi. (Ma ewuru Hebrọn afọ asaa tupu e wuo obodo Zoan dị nʼIjipt.)
NUM 13:23 Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl, ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig.
NUM 13:24 A kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Eshkọl, nʼihi ụyọkọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị Izrel gbutere nʼebe ahụ.
NUM 13:25 Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi.
NUM 13:26 Ha lọtara bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel, na Kadesh nke dị nʼọzara Paran. Ndị nledo ahụ kọrọ akụkọ otu ha si gaa nʼọgbakọ ụmụ Izrel niile. Gosikwa mkpụrụ osisi si nʼala ahụ.
NUM 13:27 Nke a bụ akụkọ ha kọọrọ Mosis, “Anyị ruru nʼala ahụ ị sị anyị gaa leta. Ọ bụkwa ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ndị a bụ mkpụrụ osisi si nʼala ahụ.
NUM 13:28 Ma ndị bi nʼobodo ahụ siri ike. Obodo ha buru ibu bụrụkwa nke e wusiri ike. Anyị hụkwara ụmụ ụmụ Anak nʼebe ahụ.
NUM 13:29 Ndị Amalek bi na Negev, ndị Het na ndị Jebus na ndị Amọrait bi nʼala ugwu ugwu. Ma nʼakụkụ osimiri Mediterenịan na ndagwurugwu mmiri Jọdan ka ndị Kenan bi.”
NUM 13:30 Ma Kaleb kwuru okwu mere ka obi sie ndị Izrel ike nʼoge a ha guzoro nʼihu Mosis sị ha, “Ka anyị gaanụ otu ihu nweta ala ahụ. Nʼihi na anyị nwere ike imeri ha.”
NUM 13:31 Ma ndị nledo ahụ soro ya gaa zara sị, “Anyị enweghị ike ibu agha megide ndị a; ha dị ike karịa anyị.”
NUM 13:32 Ndị a gbasara akụkọ ọjọọ nʼetiti ụmụ Izrel banyere ala ahụ ha gara ledoo. Ha sịrị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala na-eripịa ndị bi nʼime ya. Ndị niile anyị hụrụ nʼebe ahụ gbara nnọọ dimkpa
NUM 13:33 Anyị hụrụ ndị Nefilim nʼebe ahụ (ndị bụ ụmụ ụmụ Anak, ndị sitere na ndị Nefilim). Nʼanya anyị, anyị dịka ụkpana nʼebe ha nọ, otu a ka anyị dịkwa nʼanya ha.”
NUM 14:1 Nʼabalị ahụ, ọgbakọ Izrel niile weliri olu ha bido iti mkpu akwa. Ha kwagidere akwa a abalị niile.
NUM 14:2 Ndị Izrel niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. Ọgbakọ ahụ niile sị ha, “Ọ gaara aka mma ma a sị na anyị nwụrụ nʼala Ijipt maọbụ nʼọzara a.
NUM 14:3 Gịnị mere Onyenwe anyị ji akpọbata anyị nʼala a ime ka anyị daa nʼihu mma agha. Ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ga-aghọ ndị a dọtara nʼagha. Ọ garaghị akara anyị mma ịlaghachi azụ nʼIjipt?”
NUM 14:4 Ya mere ha kwekọrịtara nʼetiti onwe ha sị, “Ka anyị họpụtaranụ onwe anyị onyendu ga-edughachi anyị azụ nʼIjipt.”
NUM 14:5 Mgbe ahụ, Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu ọgbakọ ndị Izrel niile zukọtara nʼebe ahụ.
NUM 14:6 Mmadụ abụọ nʼime ndị nledo ahụ, Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune, dọwara uwe ha.
NUM 14:7 Ha gwara nzukọ Izrel sị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala mara mma.
NUM 14:8 Ọ bụrụ na ihe banyere anyị na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ ga-edu anyị bata nʼala ahụ, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
NUM 14:9 Unu enupukwala isi megide Onyenwe anyị. Unu atụkwala egwu ndị bi nʼime ala ahụ, nʼihi na anyị ga-emeri ha. Onyenwe anyị nọnyeere anyị. O wepụkwala aka nchebe ya nʼahụ ha. Unu atụla egwu ha.”
NUM 14:10 Ma naanị nzaghachi ọgbakọ ndị Izrel nyere nʼihi okwu nkasiobi ndị a bụ iche uche otu ha ga-esi jiri nkume tugbuo Joshua na Kaleb. Nʼoge a, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nʼụlọ nzute ahụ nye ndị Izrel niile.
NUM 14:11 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ruo ole mgbe ka ndị a ga-anọgide na-eleda m anya? Ruo ole mgbe ka ha ga-anọ ju ikwenye na m, nʼagbanyeghị ọtụtụ ihe ịrịbama nke m mere nʼetiti ha.
NUM 14:12 Aga m eji nrịa nrịa nke na-efe efe tigbuo ha. Napụ ha ihe ha nwere. Ma aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu, nke ga-adị ukwuu, dịkwa ike karịa ha.”
NUM 14:13 Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị sị ya, “Gịnị ka ndị Ijipt ga-eche banyere nke a, mgbe ha ga-anụ ya? Ha maara nke ọma otu ị sịrị jiri ike gị napụta ndị a site nʼetiti ha.
NUM 14:14 Ha agwakwala ndị bi nʼobodo ndị a ihe banyere ya. Ndị obodo ndị a anụla ihe banyere gị Onyenwe anyị, matakwa na ị nọnyeere Izrel, na gị bụ Onyenwe anyị na ndị Izrel na-ekwurịta okwu ihu na ihu. Ha anụkwala na ogidi igwe ojii gị Onyenwe anyị na-eguzo nʼelu, nʼisi anyị. Ha matakwara na ị na-edu anyị nʼime ogidi igwe ojii nʼehihie, na nʼime ogidi na-enwu ọkụ nʼabalị.
NUM 14:15 Ma ugbu a, ọ bụrụ na i gbusie ndị gị a dum, mba niile nụrụla akụkọ ndị a banyere gị ga-asị,
NUM 14:16 ‘Onyenwe anyị enweghị ike ịkpọbata ndị a nʼala ahụ o kwere nkwa inye ha. Ọ bụ ya mere o ji gbuo ha nʼọzara.’
NUM 14:17 “Ugbu a ka Onyenwe anyị gosi ike ya dị ukwuu, dịka i si kwuo.
NUM 14:18 Onyenwe anyị bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, onye jupụtara nʼịhụnanya, onye na-agbaghara mmehie na nnupu isi. Ma ọ dịghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.
NUM 14:19 Dịka ịdị ukwuu nke ịhụnanya gị si dị; gbaghara mmehie nke ndị a mere, dịka i si agbaghara ha kemgbe ha hapụrụ Ijipt ruo ugbu a.”
NUM 14:20 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya, “Agbagharala m ha dịka ị rịọrọ.
NUM 14:21 Ma dịka m na-adị ndụ na dịka ọ bụ eziokwu na ụwa niile ga-ejupụta nʼebube Onyenwe anyị.
NUM 14:22 Ọ dịghị otu onye nʼetiti ndị ikom niile hụrụla ebube m, na ọrụ ịrịbama niile m rụrụ nʼime Ijipt, na nʼime ọzara a, ma bụrụ onye nupuru isi nye m na onye nwaara m ugboro iri ndị a,
NUM 14:23 o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-ahụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye nna nna ha. O nweghị onye ọbụla nʼime ndị a lelịrị m ga-ahụ ala ahụ anya.
NUM 14:24 Ma ohu m nwoke Kaleb bụ nwoke nwere mmụọ dị iche. O rubeere m isi nʼihe niile. Aga m akpọbata ya nʼala ahụ ọ banyere dịka onye nledo. Ụmụ ụmụ ya niile ga-eketa ya.
NUM 14:25 Ma ugbu a, ebe ndị Izrel na-atụ ndị Amalek na ndị Kenan bi nʼime ndagwurugwu ahụ egwu, echi, unu ga-atụgharịa laghachi azụ nʼọzara ahụ; chee ụzọ gaje Osimiri Uhie ahụ ihu.”
NUM 14:26 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
NUM 14:27 “Ruo ole mgbe ka ọgbakọ ọjọọ a ga-anọgide na-atamu ntamu megide m? Nʼihi na anụla m ntamu niile nke ndị Izrel a.
NUM 14:28 Gwa ha si, ‘Dị ka m na-adị ndụ, ka Onyenwe anyị kwubiri, aga m emeso unu mmeso dịka unu kwunyere ya na ntị m.
NUM 14:29 Unu niile ga-anwụpịa nʼime ọzara a! Onye ọbụla nʼime unu niile gbarala iri afọ abụọ maọbụ karịa, nke tamuru ntamu megide m.
NUM 14:30 O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abanye nʼala ahụ, m sitere nʼaka m welie elu ṅụọ iyi ime ka ọ bụrụ ebe obibi unu, karịa Kaleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.
NUM 14:31 Ma ebe unu tụrụ egwu sị na ụmụ unu na-aga ibu ndị ohu nye ndị bi nʼala ahụ. Lee na aga m edubata ha nʼime ala ahụ. Ha ga-eketakwa ala ahụ unu jụrụ, nke unu ledara anya.
NUM 14:32 Ma unu onwe unu, ozu unu ga-ada aghara aghara nʼọzara a.
NUM 14:33 Ụmụ unu ga-abụkwa ndị ọzụzụ atụrụ nʼime ọzara a iri afọ anọ, na-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi, ruo mgbe ozu onye ikpeazụ nʼime unu ga-atọgbọrọ nʼime ọzara.
NUM 14:34 Iri afọ anọ ka unu ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie unu, matakwa ihe ọ pụtara bụ mụ iguzo megide unu, ya bụ otu afọ ga-anọchi otu ụbọchị nʼime iri ụbọchị anọ ahụ unu ji ledoo ala ahụ anya.
NUM 14:35 Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya. Nke a ka m na-aghaghị ime ka ọ dakwasị ajọ nzukọ ndị a, bụ ndị gbakọrọ megide m. Ha ga-ezute ọgwụgwụ ha nʼọzara, nʼebe a ka ha ga-anwụ.’ ”
NUM 14:36 Ya mere ndị ahụ Mosis zipụrụ iledo ala ahụ, ndị ahụ lọtara mee ka ọgbakọ ụmụ Izrel tamuo ntamu nʼihi akụkọ ọjọọ ha gbasara.
NUM 14:37 Ndị ikom ndị ahụ e si nʼọnụ ha gbasaa akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ, ka e ji nrịa nrịa na-efe efe tigbuo nʼihu Onyenwe anyị.
NUM 14:38 Nʼime ndị ikom gara ledoo ala ahụ anya, ọ bụ naanị Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune fọdụrụ ndụ.
NUM 14:39 Mgbe Mosis gwara ụmụ Izrel okwu niile si nʼọnụ Onyenwe anyị, ha ruru ụjụ dị ilu.
NUM 14:40 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri nʼoge bulie ije ịga nʼala ugwu ugwu ahụ. Ha sịrị, “Anyị emehiela. Ugbu a anyị ejikerela ije nʼala ahụ Onyenwe anyị kwere anyị nkwa.”
NUM 14:41 Ma Mosis zara sị ha, “Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị nyere? Nke a agaghị aga nke ọma.
NUM 14:42 Unu arịgokwala, nʼihi na Onyenwe anyị anọghị nʼetiti unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu.
NUM 14:43 Nʼihi na ndị Amalek na ndị Kenan nọ na-eche unu nʼebe ahụ! Ebe ọ bụ na unu esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ wezuga onwe unu, ọ gaghị anọnyere unu, unu ga-adakwa nʼihu mma agha.”
NUM 14:44 Nʼagbanyeghịkwa nke a, na ha enweghị nkwado. Ha rigooro ruo ebe kachasị elu nʼobodo ahụ dị nʼugwu, ọ bụ ezie na Mosis maọbụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị esighị nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ pụọ.
NUM 14:45 Mgbe ahụ, ndị Amalek na ndị Kenan bụ ndị bi nʼobodo ugwu ahụ, rịdatara lụso ha ọgụ. Tidaa ha nʼala ruo Homa.
NUM 15:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 15:2 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu batara ala ahụ m na-enye unu dịka ụlọ unu,
NUM 15:3 ọ bụrụ na unu echee nʼihu Onyenwe anyị aja nsure ọkụ nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị, maọbụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ nke si nʼigwe ewu na atụrụ, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ndị ọzọ, maka imezu nkwa pụrụ iche maọbụ onyinye afọ ofufu, maọbụ aja mmemme.
NUM 15:4 Onye wetara onyinye a aghaghị iweta nʼihu Onyenwe anyị aja mkpụrụ ọka nke bụ ezi ụtụ ọka ruru lita abụọ nke e ji mmanụ ruru otu lita gwakọtaa.
NUM 15:5 Ọ ga-eweta otu lita mmanya dịka onyinye ihe ọṅụṅụ maka nwa atụrụ ọbụla e ji chụọ aja nsure ọkụ maọbụ aja ụzọ.
NUM 15:6 “ ‘Ọ bụrụ nwa ebule ka e ji achụ aja ahụ, weta lita ezi ụtụ ọka anọ na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ jitụ ntakịrị karịa otu lita,
NUM 15:7 tinyekwa ya mmanya jitụ ihe nta karịa otu lita ka ọ bụrụ onyinye ihe ọṅụṅụ nye ha, dịka aja nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
NUM 15:8 “ ‘Mgbe i ji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, maọbụ aja imezu nkwa, maọbụ aja udo nye Onyenwe anyị,
NUM 15:9 tinyere oke ehi ahụ, ị ghaghị iji ezi ụtụ ọka ruru lita isii na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ ruru lita abụọ.
NUM 15:10 Wetakwa lita mmanya abụọ nke ga-abụ onyinye ihe ọṅụṅụ. Ọ ga-abụ onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
NUM 15:11 Nke a bụ usoro a ga-agbaso nʼoge ọbụla e ji nwa oke ehi, maọbụ nwa ebule, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ nwa ewu chụọ aja.
NUM 15:12 Meenụ ya maka anụ ụlọ ọbụla nʼoge niile ọbụla unu na-achụ aja.
NUM 15:13 “ ‘Onye ọbụla bụ nwa afọ ala aghaghị ime ihe ndị a mgbe ọbụla o wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye dịka onyinye isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
NUM 15:14 Nʼọgbọ niile na-abịa, mgbe ọbụla onye ọbịa, maọbụ onye ọzọ bi nʼetiti unu wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị, ọ ghaghị ịgbaso ụzọ a nye onyinye ya.
NUM 15:15 Ọgbakọ ụmụ Izrel ga-enwe otu iwu ga-adịrị unu na ndị ọbịa bi nʼetiti unu. Nke a bụ ụkpụrụ ebighị ebi ga-adịrị ọgbọ niile na-abịa. Unu na ndị ọbịa ga-abụ otu nʼihu Onyenwe anyị.
NUM 15:16 Otu iwu na otu ụkpụrụ bụ ihe ga-adịrị onye ọbụla, diala na ndị ọbịa bi nʼetiti unu.’ ”
NUM 15:17 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 15:18 “Gwa ndị Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-akpọbata unu nʼime ya,
NUM 15:19 ọ bụrụ na unu erie nri dị nʼala ahụ, wetanụ ụfọdụ nʼime nri ahụ dịka onyinye nye Onyenwe anyị.
NUM 15:20 Wetanụ ogbe achịcha site nʼọka mbụ unu ga-akwọ, chee ya nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye e wetara site nʼebe ịzọcha ọka.
NUM 15:21 Unu aghaghị inye Onyenwe anyị onyinye a sitere nʼọka mbụ ọbụla unu kwọrọ, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
NUM 15:22 “ ‘Ọ bụrụ na unu amaghị ama ghara idebe iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis,
NUM 15:23 bụ iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere unu site nʼaka Mosis, site nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị nyere ha ruo nʼọgbọ niile nke na-abịa.
NUM 15:24 Ọ bụrụ na e mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụ na ọgbakọ ụmụ Izrel amaghị ama mee ya, mgbe ahụ, ọgbakọ ụmụ Izrel ga-eji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, aja na-esi isi ụtọ nke Onyenwe anyị na-anabata. Aghaghị iwetakwa mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ nke ya na aja ahụ so, tinyere otu mkpi maka aja mmehie.
NUM 15:25 Onye nchụaja ga-ekpuchitere nzukọ Izrel niile mmehie ha. A ga-agbagharakwa ha mmehie ha niile, nʼihi na ọ bụ mmehie ha mere na-amaghị ama. Ha e cheela nʼihu Onyenwe anyị aja onyinye nri nʼihi amaghị ama ha ya na aja mmehie.
NUM 15:26 A ga-agbaghara nzukọ Izrel niile na ndị ọbịa nọ nʼetiti ha mmehie ha, nʼihi na mmadụ ndị a niile akpachaghị anya mehie.
NUM 15:27 “ ‘Ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu onye mehiere na-amaghị ama, ọ ga-eweta nwa nne ewu gbara otu afọ maka aja mmehie.
NUM 15:28 Onye nchụaja a ga-eji ya chụọ aja ikpuchitere onye ahụ na-amaghị ama mehie mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe ekpuchichara mmehie ya, a ga-agbaghara onye ahụ.
NUM 15:29 Ọ bụ otu iwu a dịrị onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maọbụ nwa afọ Izrel, maọbụ onye ọbịa nke bi nʼetiti unu.
NUM 15:30 “ ‘Ma onye ọbụla kpachapụrụ anya mehie, maọbụ nwa afọ maọbụ onye ọbịa, nke na-ekwulu Onyenwe anyị, a ga-ebipụ onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel.
NUM 15:31 Nʼihi na ha eledala okwu Onyenwe anyị anya, mebie ihe o nyere nʼiwu. A ghaghị ibipụ onye dị otu a, mmehie ha ga-adịkwa ha nʼisi.’ ”
NUM 15:32 Mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara, e jidere otu onye nʼime ha ka ọ na-akpa nkụ nʼụbọchị izuike.
NUM 15:33 Ndị hụrụ ya ebe ọ na-akpa nkụ duuru ya jekwuru Mosis na Erọn na ọgbakọ ụmụ Izrel.
NUM 15:34 Ha tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ nʼihi na o doghị anya ihe e kwesiri ime ya.
NUM 15:35 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Nwoke a ghaghị ịnwụ. Ọgbakọ Izrel niile ga-atụ ya nkume nʼazụ obodo.”
NUM 15:36 Ya mere, ọgbakọ ahụ kpọpụrụ ya nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
NUM 15:37 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 15:38 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nʼọgbọ niile na-abịa unu ga-adụnye eriri akwa nʼọnụ ala ala uwe unu. Unu ga-eji eriri na-acha anụnụ anụnụ dụnye ya.
NUM 15:39 Eriri akwa ndị a dị nʼọnụ ọnụ uwe unu ga-eme ka unu cheta iwu niile Onyenwe anyị nyere unu. Ka unu rube isi na ha hapụ imerụ onwe unu site na ịgbaso ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu na anya unu.
NUM 15:40 Mgbe ahụ unu ga-echeta irube isi nʼiwu m niile, bụrụ ndị e doro nsọ nye Chineke unu.
NUM 15:41 Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu ịbụ Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”
NUM 16:1 Ugbu a, Kora nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livayị, na ụfọdụ ndị agbụrụ Ruben bụ Datan, na Abiram ụmụ Eliab, na On, nwa Pelet nupuru isi
NUM 16:2 bilie imegide Mosis. Ndị so ha bụ narị ndị ikom abụọ na iri ise, ndị ndu a maara nke ọma, ndị so nọdụ nʼụlọ nzukọ ukwuu ndị Izrel.
NUM 16:3 Ha kpọrọ ọgbakọ imegide Mosis na Erọn sị ha, “Omume unu agafeela oke! Ọgbakọ Izrel dị nsọ, onye ọbụla nʼime ha kwa. Onyenwe anyị nọnyeere ha. Gịnị mere unu ji ebuli onwe unu elu karịa ọgbakọ Onyenwe anyị?”
NUM 16:4 Mgbe Mosis nụrụ ihe ndị a ha kwuru, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala.
NUM 16:5 Mgbe ahụ, ọ gwara Kora na ndị niile sonyeere ya, sị, “Nʼụtụtụ echi, Onyenwe anyị ga-eme ka amara ndị bụ ndị ya na onye dị nsọ. Ọ ga-eme ka onye ahụ bịaruo ya nso. Onye ọ ga-ahọpụta ka ọ ga-emekwa ka ọ bịaruo ya nso.
NUM 16:6 Lee ihe ị ga-eme, Echi gị onwe gị Kora, na ndị niile nọnyeere gị, chịrịnụ ihe ịgụ ọkụ,
NUM 16:7 mụnye ha ọkụ. Tinyekwanụ ụda na-esi isi ụtọ nʼime ha, were ha bịa nʼihu Onyenwe anyị. Onye ahụ Onyenwe anyị họpụtara ga-abụ onye ahụ dị nsọ. O zuorola unu, unu ụmụ Livayị!”
NUM 16:8 Mgbe ahụ, Mosis gwakwara Kora okwu ọzọ sị ya, “Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị Livayị!
NUM 16:9 Ọ bụ ihe dị nta nʼanya unu na Chineke nke Izrel kewapụtara unu site na nzukọ ndị Izrel niile, mee ka unu bịaruo ya nso, nʼihi ije ozi nʼụlọ nzute Onyenwe anyị, nakwa iguzo nʼihu nzukọ Izrel niile ijere ha ozi?
NUM 16:10 Ọ kpọbatala gị na ndị Livayị ibe gị nso ebe ọ nọ. Ugbu a, unu na-achọkwa ọrụ nchụaja?
NUM 16:11 Ọ bụ Onyenwe anyị ka gị na ndị sonyeere gị gbara izu megide. Onye ka Erọn bụ unu ji atamu ntamu megide ya?”
NUM 16:12 Mgbe ahụ, Mosis ziri ozi ka a kpọọ Datan na Abiram, ụmụ ndị ikom Eliab, ma ha sịrị, “Anyị agaghị abịa.
NUM 16:13 Ọ bụ na o zurughị gị na i si nʼala Ijipt ebe mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru kpọpụta anyị igbuchapụ anyị nʼọzara a? Ugbu a ị chọkwara ime onwe gị onyenwe anyị?
NUM 16:14 Nke kachasị nke, ị kpọbatabeghị anyị nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. I nyebeghị anyị ihe nketa ala ubi na ubi vaịnị. Ị chọrọ ịghụpụsị ndị ikom ndị a mkpụrụ anya? Anyị agaghị abịa!”
NUM 16:15 Mgbe ahụ, oke iwe were Mosis. Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Anabatakwala aja ha niile! Ọ dịbeghị oge m naara ha ihe ọbụla, ọbụladị otu ịnyịnya ibu! O nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha m mejọrọ.”
NUM 16:16 Mgbe ahụ, Mosis sịrị Kora, “Echi, gị na ndị na-esonyere gị ga-apụta bịa nʼihu Onyenwe anyị. Erọn ga-abịakwa.
NUM 16:17 Nwoke ọbụla ga-eweta ihe ịgụ ọkụ nke ya, tinye ya ụda na-esi isi ụtọ, chee ha nʼihu Onyenwe anyị. Ha niile dị ihe ịgụ ọkụ narị abụọ na iri ise. Gị na Erọn ga-ejikwa nke unu bịa.”
NUM 16:18 Ya mere, nwoke ọbụla wetara ihe ịgụ ọkụ nke ya, mụnye ya ọkụ, ma tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Ha niile guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, ha na Mosis na Erọn.
NUM 16:19 Mgbe Kora kpọkọtara ndị na-eso ya imegide Mosis na Erọn nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nye ọgbakọ Izrel niile.
NUM 16:20 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
NUM 16:21 “Sitenụ nʼetiti ọgbakọ ndị a pụọ, ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.”
NUM 16:22 Ma Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu Onyenwe anyị rịọọ ya sị, “O Chineke, gị bụ Chineke nwe ndụ mmadụ niile, ị ga-ewe iwe megide nzukọ niile nʼihi mmehie otu onye?”
NUM 16:23 Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya,
NUM 16:24 “Gwa nzukọ Izrel niile sị ha, ‘Wezuganụ onwe unu site nʼụlọ ikwu Kora, Datan na Abiram.’ ”
NUM 16:25 Mosis biliri jekwuru Datan na Abiram, ndị okenye Izrel sokwa Mosis.
NUM 16:26 Mgbe Mosis ruru nʼebe ahụ, ọ dọrọ nzukọ Izrel aka na ntị sị, “Ngwa, sinụ nʼụlọ ndị ọjọọ a wezuga onwe unu. Unu ebitụkwala ihe ọbụla bụ nke ha aka. Ma ọ bụghị otu a, a ga-agụnyekọ unu na mmehie ha, lakọọ unu na ha nʼiyi.”
NUM 16:27 Ya mere mmadụ niile wezugara onwe ha site nʼọmụma ụlọ ikwu Kora, na Datan na Abiram. Ma Datan na Abiram pụtara guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, ha onwe ha na ndị nwunye ha niile, na ụmụ ha niile, na ụmụntakịrị ha niile.
NUM 16:28 Mgbe ahụ, Mosis kwuru sị, “Ugbu a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ime ihe ndị a niile m mere. Nʼihi na-emeghị m ha site nʼuche nke onwe m.
NUM 16:29 Ọ bụrụ na ndị ikom ndị a anwụọ ọnwụ chi ha, bụ ụdị nleta nke dịrị mmadụ ọbụla, mgbe ahụ, matanụ na ọ bụghị Onyenwe anyị zitere m.
NUM 16:30 Ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala Onyenwe anyị anya.”
NUM 16:31 Mgbe Mosis kpụ okwu a nʼọnụ ya, lee ala ahụ Kora, na Datan, na Abiram, na ndị ezinaụlọ ha niile guzo nʼelu ya kewara abụọ nʼotu ntabi anya ahụ,
NUM 16:32 ala ahụ meghere ọnụ ya, loo ha, na ezinaụlọ ha niile, na ndị ahụ niile so Kora, na ihe niile ha nwere.
NUM 16:33 Ha niile rịdaruru nʼala ndị nwụrụ anwụ na ndụ. Ala ahụ kpuchikwara ha niile, si otu a mee ka ha laa nʼiyi.
NUM 16:34 Ndị Izrel niile nọ ha gburugburu gbara ọsọ, mgbe ha tiri mkpu akwa, na-asị, “Ala na-agakwa iloda anyị.”
NUM 16:35 Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
NUM 16:36 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 16:37 “Gwa Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka o site nʼọkụ ahụ wepụta ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ niile nʼihi na ha dị nsọ. Ọ ga-ekposakwa icheku ọkụ niile nʼakụkụ niile.
NUM 16:38 Ha bụ ihe ịgụ ọkụ nke ndị ikom sitere na mmehie ha tufuo ndụ ha. Ka etipịa ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ. Mee ha ka ha ghọọ ihe sara mbara nke a ga-eji machite ebe ịchụ aja, nʼihi na e chere ha nʼihu Onyenwe anyị, ha aghọọla ihe dị nsọ. Ka ha bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Izrel niile.”
NUM 16:39 Ya mere Elieza, onye nchụaja, chịkọtara ihe ịgụ ọkụ bronz ndị ahụ nke ndị ahụ a kpọrọ ọkụ wetara, tipịa ha, mee ka ha ghọọ ihe sara mbara e ji ekpuchi ebe ịchụ aja,
NUM 16:40 dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu site nʼọnụ Mosis. Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị Izrel niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru Onyenwe anyị nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere Kora na ndị sonyere ya ghara ime ha.
NUM 16:41 Ma nʼụtụtụ echi ya, nzukọ Izrel niile malitere itamu ntamu megide Mosis na Erọn sị, “Unu egbuchaala ndị nke Onyenwe anyị.”
NUM 16:42 Ma mgbe ọgbakọ Izrel zukọtara imegide Mosis na Erọn, mgbe ha chere ihu nʼụlọ nzute, na mberede, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị pụtakwara ihe.
NUM 16:43 Mgbe ahụ, Mosis na Erọn gara nʼihu ụlọ nzute ahụ.
NUM 16:44 Ma Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
NUM 16:45 “Sinụ nʼetiti ọgbakọ a pụọ ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.” Ha dara kpuo ihu nʼala.
NUM 16:46 Mgbe ahụ, Mosis sịrị Erọn, “Ngwa, were ihe ịgụ ọkụ ma site nʼebe ịchụ aja gụnye ya ọkụ. Tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Burukwa ya gaa ngwangwa nʼetiti nzukọ Izrel ka i kpuchiere ha mmehie ha, nʼihi na iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla ha. Nrịa nrịa na-efe efe amalitekwalarị ibibi ha.”
NUM 16:47 Erọn mere dịka Mosis kwuru. O mere ngwangwa gbaba nʼetiti ndị Izrel nʼihi na nrịa nrịa ahụ ebidola nʼezie ịdakwasị ha. Erọn mụnyere ụda na-esi isi ụtọ ahụ ọkụ, si otu ahụ kpuchiere ha mmehie ha niile.
NUM 16:48 O guzokwara nʼetiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ tutu ihe otiti ahụ akwụsị.
NUM 16:49 Ma ihe otiti ahụ egbuolarị puku mmadụ iri, puku anọ na narị asaa (14,700). A gụnyeghị ndị niile ahụ so Kora nwụọ nʼụbọchị gara aga.
NUM 16:50 Mgbe ahụ, Erọn laghachikwutere Mosis nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, nʼihi na nrịa nrịa ahụ na-efe efe akwụsịla.
NUM 17:1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 17:2 “Gwa ụmụ Izrel okwu, sitekwa nʼaka ha nata mkpanaka iri na abụọ otu mkpanaka nʼisi onyendu nke ebo ọbụla. Dekwasị aha onyendu ọbụla nʼahụ mkpanaka nke ya.
NUM 17:3 Ma nʼelu mkpanaka Livayị dekwasị aha Erọn. A ga-enwe otu mkpanaka maka onyendu ebo ọbụla.
NUM 17:4 Tinye mkpanaka ndị a niile nʼime ụlọ nzute, nʼihu Ihe Ama ahụ, ebe m na-ezute gị.
NUM 17:5 Mkpanaka nke onye ahụ m họpụtara ga-ama ifuru ndụ. M ga-ewezugakwa ntamu niile nke ndị Izrel site nʼebe m nọ, bụ nke ha na-atamu megide unu.”
NUM 17:6 Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu ndị a. Ndị ndu ha nyere ya mkpanaka iri na abụọ, otu mkpanaka nʼisi otu onyeisi maka onyeisi ebo ha nʼotu nʼotu. Mkpanaka Erọn dịkwa nʼetiti nke ha.
NUM 17:7 Mosis chịịrị ha niile dozie ha nʼihu Onyenwe anyị nʼime ime ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.
NUM 17:8 Nʼechi ya, Mosis banyere nʼụlọ nzute Ihe Ama ahụ chọpụta na ọ bụghị naanị na mkpanaka Erọn, onye nọchitere anya ebo Livayị, amaala ifuru, kama na ọ waala okoko ma mịakwa mkpụrụ osisi chara acha a na-akpọ alụmọnd.
NUM 17:9 Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị wepụta mkpanaka ndị ahụ niile gosi ha ndị Izrel niile. Ha hụrụ ha, ma nwoke ọbụla weghachiri mkpara osisi nke ya.
NUM 17:10 Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Tinye mkpanaka Erọn nʼihu Ihe Ama ahụ, ka ọ dịgide nʼebe ahụ dịka ihe ama nye ndị nnupu isi. Nke a ga-eme ka ntamu ndị a megide m kwụsị, ka ha ghara ịnwụ.”
NUM 17:11 Ya mere, Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
NUM 17:12 Ma ndị Izrel zara Mosis sị ya, “Ndị nwụrụ anwụ ka anyị bụ! Ofufu ka anyị furu. Nʼezie anyị bụ ndị furu efu.
NUM 17:13 Onye ọbụla bịaruru nso ebe obibi Onyenwe anyị ga-anwụ. Anyị niile ga-anwụ?”
NUM 18:1 Onyenwe anyị gwara Erọn sị, “Gị, na ụmụ gị ndị ikom gị, na ezinaụlọ nna gị ga-ebu ahụhụ ajọ omume metụtara ebe nsọ ahụ. Gị na ụmụ gị ndị ikom naanị ka ọ dị nʼaka ịsa ajụjụ ihe ọjọọ ọbụla banyere ọrụ nchụaja.
NUM 18:2 Site nʼebo unu kpọbata ụmụnna gị ndị Livayị ka ha sonyere gị ma nyere gị aka mgbe gị na ụmụ gị ndị ikom na-eje ozi nʼụlọ nzute Ihe Ama.
NUM 18:3 Ha ga-anọ gị nʼokpuru ije ozi niile nʼụlọ nzute, ma ha agaghị abịaru nso ngwongwo e ji chọọ ebe nsọ ahụ mma, maọbụ nʼebe ịchụ aja. Ma ọ bụghị otu a, gị na ha ga-anwụ.
NUM 18:4 Ha ka ọ dịrị, isonye gị nʼilekọta ụlọ ikwu ahụ, ya bụ, ihe niile metụtara ụlọ ikwu anya. O nweghị onye ọzọ nke ga-abịa nso ebe ị nọ.
NUM 18:5 “Gị ka ọ dịrị ilekọta ihe niile metụtara ebe nsọ ahụ, na ebe ịchụ aja ahụ, ka oke iwe Onyenwe anyị ghara ịdakwasị onye ọbụla nʼala Izrel ọzọ.
NUM 18:6 Mụ onwe m ahọpụtala ụmụnna gị ndị Livayị site nʼetiti ndị Izrel, were ha nye gị dịka onyinye, ka ha bụrụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị maka ịrụ ọrụ ụlọ nzute.
NUM 18:7 Ma ọ bụ naanị gị, na ụmụ gị ndị ikom, ga-aga ozi dịka ndị nchụaja, ozi metụtara ebe ịchụ aja, na ihe niile dị nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Ana m enye gị ọrụ nchụaja dịka onyinye. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ga-anwụ.”
NUM 18:8 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Mụ onwe m emeela gị onye nlekọta onyinye niile a na-eche nʼihu m, onyinye niile dị nsọ nke ụmụ Izrel wetara m ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom dịka oke ruuru unu site nʼụkpụrụ ebighị ebi.
NUM 18:9 Unu ga-enwere akụkụ aja ahụ kachasị nsọ nke a na-edopụ iche site nʼọkụ. Site nʼonyinye niile nke a na-ewetara m, bụ onyinye mkpụrụ ọka maọbụ aja mmehie maọbụ aja ikpe ọmụma, ndị ahụ a na-edopụ iche dịka ihe kachasị nsọ, ha ga-abụ oke gị na ụmụ gị ndị ikom.
NUM 18:10 A ga-eri ha dịka ihe dịkarịrị nsọ. Nwa nwoke ọbụla ga-eri ya. Unu ga-agụ ha dịka ihe dị nsọ.
NUM 18:11 “Nke a bụkwa nke gị: Ihe ọbụla nke ewezugara site nʼonyinye nke aja mfufe niile nke ndị Izrel wetara. Mụ onwe m na-ewere nke a nye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Onye ọbụla nke dooro onwe ya ọcha nʼezinaụlọ nwere ike iri ya.
NUM 18:12 “Ana m enye gị mmanụ oliv nke kachasị mma, na mmanya ọhụrụ nke kachasị mma na ọka, bụ mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ha na-ewetara Onyenwe anyị.
NUM 18:13 Mkpụrụ mbụ nke ihe niile dị nʼala nke ha na-ewebatara Onyenwe anyị, ga-abụ nke gị. Onye ọbụla nke dị ọcha nʼezinaụlọ unu nwere ike iso rie ya.
NUM 18:14 “Ihe niile e doro nsọ nʼala Izrel niile nye Onyenwe anyị bụ nke gị.
NUM 18:15 Ihe niile e bụ ụzọ mụọ, ma mmadụ ma anụ ụlọ, nke e nyere Onyenwe anyị dịka onyinye, bụ nke gị. Ma unu aghaghị ịgbara ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ, na ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ ndị na-adịghị ọcha.
NUM 18:16 Mgbe ha dị otu ọnwa, a ga-eji shekel ọlaọcha ise, nʼusoro shekel ebe nsọ, nke bụ iri ihe ọtụtụ gera abụọ gbapụta ha.
NUM 18:17 “Ma a gaghị agbara nwa ehi mbụ, maọbụ nwa atụrụ mbụ maọbụ nwa ewu mbụ. Ha dị nsọ. Fesa ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, ma kpọọ abụba ha ọkụ dịka onyinye e nyere site nʼọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.
NUM 18:18 Ozu anụ ndị a niile e gburu ga-abụ nke gị, dịka obi anụ na apata ụkwụ aka nri anụ nke aja mfufe a na-eche nʼihu Onyenwe anyị nʼebe ịchụ aja si bụrụ nke gị.
NUM 18:19 Ihe ọbụla e dopụrụ iche site nʼonyinye nsọ niile ụmụ Izrel chere nʼihu Onyenwe anyị ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke ruuru unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Ọ bụ ọgbụgba ndụ nnu ebighị ebi nʼihu Onyenwe anyị nye gị na ụmụ ụmụ gị.”
NUM 18:20 Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Unu agaghị enwe ihe nketa nke ala, a gaghị ekenyekwa unu ala ọbụla nʼala Izrel niile. Nʼihi na mụ onwe m bụ oke na ihe nketa unu nwere nʼetiti ụmụ Izrel.
NUM 18:21 “Enyela m ndị Livayị, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri ahụ ụmụ Izrel niile na-akwụbatara m. Nke a bụ ihe nketa ha nʼihi ọrụ ha na-arụ nʼụlọ nzute.
NUM 18:22 Site ugbu a gaa nʼihu, o nweghị onye Izrel ọbụla kwesiri ịbịa nso ụlọ nzute ahụ, ka ha ghara iwetara onwe ha ikpe ọmụma, mmehie na ọnwụ.
NUM 18:23 Ọ bụ naanị ụmụ Livayị ga-arụ ọrụ nʼụlọ nzute ahụ. Ha ka ọ dịrị ibu ahụhụ ajọ omume ọbụla banyere ejezighị ozi nke ụlọ nzute. Ụkpụrụ a ga-adị ebighị ebi ruo ọgbọ niile dị nʼihu. Ndị Livayị agaghị enwe ihe nketa nke aka ha nʼetiti ụmụ Izrel.
NUM 18:24 Kama, enyela m ndị Livayị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ niile ndị Izrel na-ewetara Onyenwe anyị ka ọ bụrụ ihe nketa ha. Ọ bụ nke a mere m ji kwuo sị, ‘Ha agaghị enweta ihe nketa nʼetiti ụmụ Izrel.’ ”
NUM 18:25 Onyenwe anyị gwakwara Mosis okwu sị,
NUM 18:26 “Gwa ndị Livayị okwu sị, ‘Mgbe unu si nʼaka ụmụ Izrel nata onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ m nyere unu dịka ihe nketa, unu aghaghị isite nʼonyinye ahụ nye otu ụzọ nʼime ụzọ iri dịka onyinye nye Onyenwe anyị.
NUM 18:27 A ga-agụ onyinye unu wetara dịka ọ bụ onyinye ọka unu si nʼebe ịzọcha ọka weta, maọbụ dịka mmanya unu si nʼebe ịzọcha mmanya weta.
NUM 18:28 Nʼụzọ dị otu a, unu onwe unu ga-eche onyinye unu nʼihu Onyenwe anyị site nʼonyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu si nʼaka ụmụ Izrel nata. Site nʼonyinye ndị a unu natara, unu ga-enye Erọn onye nchụaja onyinye ahụ ruuru Onyenwe anyị.
NUM 18:29 Onyinye unu ga-enye dịka nke ruuru Onyenwe anyị ga-abụ akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, na ndị kachasị ịdị nsọ.’
NUM 18:30 “Gwa ndị Livayị okwu sị ha, ‘Mgbe unu wetara akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, a ga-agụnyere unu ya dịka a ga-asị na ọ bụ onyinye unu si nʼebe ịzọcha ọka, na nʼebe ịzọcha mmanya vaịnị unu weta.
NUM 18:31 Unu na ezinaụlọ unu nwere ike iri ndị fọdụrụ nʼụlọ unu, maọbụ nʼebe ọbụla masịrị unu, nʼihi na ha bụ ụgwọ ọrụ unu nʼihi ozi niile unu jere nʼụlọ nzute.
NUM 18:32 Ikpe ọmụma agaghị adịrị unu mgbe unu na-eri ya ma ọ bụrụ na unu chere onyinye ndị ahụ kachasị mma nʼihu Onyenwe anyị. Ma kpachapụnụ anya hụ na unu e merụghị onyinye ndị a dị nsọ ụmụ Izrel webatara. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu ga-anwụ.’ ”
NUM 19:1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
NUM 19:2 “Ndị a bụ ụkpụrụ dị nʼiwu ahụ Onyenwe anyị nyere. Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara gị nwa nne ehi na-acha uhie uhie nke na-enweghị ntụpọ, na nke ụdọ yoku na-agabeghị nʼolu ya.
NUM 19:3 Nye ya Elieza onye nchụaja, ka ọ kpụrụ ya pụọ nʼazụ ogige, ebe otu onye ga-egbu ya mgbe ọ nọ na-ele ya anya.
NUM 19:4 Elieza bụ onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara ya na mkpịsịaka ya, fesa ya na ncherita ihu ụlọ nzute ahụ ugboro asaa.
NUM 19:5 Mgbe ahụ, onye ọzọ ga-akpọ nwa nne ehi ahụ ọkụ mgbe Elieza nọkwa na-ele ya anya. Ọ ga-akpọ akpụkpọ ya, anụ ya, ọbara na mgbịrị afọ ya ọkụ.
NUM 19:6 Onye nchụaja ga-ewere osisi sida, na osisi hisọp, na ogho uhie, tụba ha nʼetiti ebe ahụ a kpọrọ nwa nne ehi ahụ ọkụ.
NUM 19:7 Emesịa, onye nchụaja ahụ ga-asacha uwe niile o yi; sakwaa ahụ ya. Ọ ga-alọghachikwa azụ nʼime ogige ahụ ebe ọ ga-anọ dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.
NUM 19:8 Onye ahụ kpọrọ nwa ehi ahụ ọkụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya. Ọ ga-anọkwa ọnọdụ onye na-adịghị ọcha ruo anyasị.
NUM 19:9 “Mgbe ahụ, onye nke dị ọcha, ga-ekpokọta ntụ ozu nwa nne ehi ahụ, wụnye ya nʼebe dị ọcha nʼazụ ogige ahụ. Ebe ahụ ka nzukọ Izrel ga-edebe ya maka ikporo wụnye na mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha. Ọ bụ maka nsacha pụọ na mmehie.
NUM 19:10 Ma onye ahụ ga-ekpokọta ntụ nsure ọkụ nwa nne ehi ahụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya, nọkwaa dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. Iwu a ga-adịgidere ndị Izrel na ndị ọbịa binyere ha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
NUM 19:11 “Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
NUM 19:12 Ha aghaghị iji mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha saa ahụ ha nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Mgbe ahụ, ha ga-adị ọcha. Ma ọ bụrụ na ha asaghị ahụ ha nʼụbọchị nke atọ nakwa nʼụbọchị nke asaa, ha ga-anọgide bụrụ ndị na-adịghị ọcha ọ bụladị mgbe ụbọchị asaa ahụ gafesịrị.
NUM 19:13 Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ma ọ saghị ahụ ya dịka usoro a si dị, o merụọla ebe nsọ Onyenwe anyị. A ga-ewezuga onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel. Ebe ọ bụ na a wụsaghị ya mmiri nsacha ahụ; ọ ga-anọgide bụrụ onye na-adịghị ọcha.
NUM 19:14 “Mgbe mmadụ nwụrụ nʼụlọ ikwu, ndị a ga-abụ iwu unu ga-eso. Ndị nọ nʼime ụlọ ikwu ahụ mgbe ọ nwụrụ na onye ọbụla banyere nʼụlọ ikwu ahụ, ga-abụ ndị na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
NUM 19:15 Ihe ọbụla nke ghere oghe, nke na-enweghị ihe mkpuchi eriri e ji kechie elu ya, ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.
NUM 19:16 “Onye gara nʼọhịa metụ onye e gburu nʼagha aka, maọbụ onye nwụrụ nʼụzọ ọzọ dị iche, ma ọ bụkwanụ metụ ọkpụkpụ, maọbụ ili onye nwụrụ anwụ aka, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
NUM 19:17 “Ma banyere onye ahụ na-adịghị ọcha, kporo ntụ site nʼime aja mmehie ahụ a kpọrọ ọkụ, tinye ya nʼime ite, wụkwasị ya mmiri e si nʼiyi na-eru eru kute.
NUM 19:18 Mgbe ahụ, nwoke nke nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha ga-ewere ụfọdụ hisọp, denye ya na mmiri ahụ fesaa ya nʼime ụlọ ikwu ahụ, na ngwongwo niile e ji dozie ụlọ ahụ, na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya nʼahụ onye ọbụla metụrụ ọkpụkpụ, maọbụ onye e gburu egbu, maọbụ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ili aka.
NUM 19:19 Nwoke ahụ dị ọcha ga-efesakwa ndị ahụ rụrụ arụ nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Nʼụbọchị nke asaa ka ọ ga-eme ka ha dị ọcha. Ndị ahụ a na-edo ọcha ga-asa uwe ha mmiri, saa ahụ ha, nʼuhuruchi ụbọchị ahụ ka ha ga-adị ọcha.
NUM 19:20 Ma ọ bụrụ na ndị ahụ merụrụ onwe ha e doghị onwe ha ọcha, aghaghị iwepụ ha site nʼetiti ọgbakọ Izrel. Nʼihi na ha merụrụ ebe nsọ Onyenwe anyị. E fesakwaghị ha mmiri nke ịdị ọcha nʼahụ, nke mere na ha adịghị ọcha.
NUM 19:21 Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide mgbe ebighị ebi. “Nwoke ahụ na-efesa mmiri ahụ e ji edo mmadụ ọcha, aghaghị ịsacha uwe ya niile. Onye ọbụla metụrụ mmiri nke ịdị ọcha ahụ aka, ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.
NUM 19:22 Ihe ọbụla kwa onye na-adịghị ọcha metụrụ aka, ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha, onye ọbụla metụkwara ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.”
NUM 20:1 Ụmụ Izrel, bụ nzukọ ahụ niile rutere nʼọzara Zin nʼọnwa nke mbụ. Ha manyere ụlọ ha na Kadesh. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Miriam nwụrụ. E lie ya.
NUM 20:2 Ma mmiri ọṅụṅụ adịghị nye ndị nzukọ ahụ. Ya mere na ha gbakọtara imegide Mosis na Erọn.
NUM 20:3 Ha sesịrị Mosis okwu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnna anyị nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.
NUM 20:4 Gịnị mere i ji kpọbata ọgbakọ nke Onyenwe anyị nʼime ọzara a, ime ka anyị na anụ ụlọ anyị niile nwụọ nʼebe a?
NUM 20:5 Gịnị mere i ji si nʼala Ijipt kpọpụta anyị, kpọbata anyị nʼebe ọjọọ a? O nweghị mkpụrụ ọghịgha maọbụ fiig, enweghị mkpụrụ vaịnị maọbụ mkpụrụ pomegranet. Ọ dịghị mmiri dị nke ha ga-aṅụ.”
NUM 20:6 Mosis na Erọn si nʼebe ọgbakọ ahụ nọ tụgharịa gaa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, daa kpụọ ihu ha nʼala. E mee ka ha hụ ebube Onyenwe anyị anya.
NUM 20:7 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
NUM 20:8 “Were mkpara ahụ, gị na nwanne gị Erọn kpọkọta nzukọ Izrel niile. Gwa nkume ahụ okwu nʼihu ha, ọ ga-asọpụta mmiri ya. Unu ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ sọpụta nye ọgbakọ ahụ, ka ha na igwe anụ ụlọ ha, ṅụọ mmiri.”
NUM 20:9 Ya mere Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị weere mkpara ahụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị.
NUM 20:10 Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?”
NUM 20:11 Mgbe ahụ Mosis weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ Izrel niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri.
NUM 20:12 Ma Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu jụrụ ikwenye nʼokwu m, jụkwa ido m nsọ nʼihu ndị Izrel niile, unu agaghị edubata ọgbakọ ndị a nʼala ahụ m na-aga inye ha.”
NUM 20:13 A kpọrọ ebe ahụ mmiri Meriba, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Izrel wesoro Onyenwe anyị iwe. O gosikwara ha ịdị nsọ ya.
NUM 20:14 Mosis sitere nʼọzara Kadesh, zipụ ndị ozi ka ha gakwuru eze Edọm, sị ya, “Otu a ka nwanne gị bụ Izrel na-ekwu: Ị nụla akụkọ ihe nhụju anya niile dakwasịrị anyị.
NUM 20:15 Nna anyị gara biri nʼala Ijipt. Anyị biri nʼebe ahụ ọtụtụ afọ. Ndị Ijipt mekpara anyị na nna nna anyị ha ahụ.
NUM 20:16 Ma mgbe anyị tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụrụ akwa anyị, zitere anyị mmụọ ozi ya, onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt. “Ugbu a, anyị nọ na Kadesh obodo dị nso nʼoke ala gị.
NUM 20:17 Biko kwere ka anyị si nʼala gị gafee. Anyị ga-akpachara anya hụ na anyị esiteghị nʼubi ihe ọkụkụ gị maọbụ nʼubi vaịnị gị gafee. Anyị agaghị aṅụ mmiri ọbụla site nʼolulu mmiri gị. Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, tutu ruo mgbe anyị gafechara oke ala gị.”
NUM 20:18 Ma eze Edọm zara sị, “Unu amanyela ụkwụ; ọ bụrụ na unu anwaa anwa bata nʼala m, aga m eji ndị agha m zute unu.”
NUM 20:19 Ma ndị Izrel zara ozi o ziri sị ya, “Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.”
NUM 20:20 Ma eze Edọm aṅaghị ntị, ọ gwaghere ha ọnụ sị, “Unu agaghị esite nʼala gabiga.” Edọm chịkọtara ọtụtụ ndị agha dị ike duru ha pụọ ịga izute ha.
NUM 20:21 Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ.
NUM 20:22 Ọgbakọ Izrel niile sitere na Kadesh bulie ije gagide rute nʼugwu Hor.
NUM 20:23 Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
NUM 20:24 “Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ Izrel, nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri Meriba.
NUM 20:25 Ugbu a, kpọrọ Erọn na nwa ya nwoke Elieza, duru ha gaa nʼugwu Hor.
NUM 20:26 Nʼebe ahụ ka ị ga-eyipụ Erọn uwe onye nchụaja o yi, yikwasị ha Elieza nwa ya nwoke. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Erọn ga-anọ nwụọ.”
NUM 20:27 Ya mere Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. Ha atọ rigoro nʼugwu Hor mgbe nzukọ Izrel niile nọ na-ele ha anya.
NUM 20:28 Mgbe ha ruru nʼelu ugwu ahụ, Mosis yipụrụ Erọn uwe onye nchụaja ya yikwasị ha nwa ya nwoke Elieza. Erọn nọkwa nʼebe ahụ, nʼelu ugwu ahụ nwụọ. Emesịa, Mosis na Elieza tụgharịrị site nʼugwu ahụ lọghachi.
NUM 20:29 Mgbe ọgbakọ Izrel nụrụ ihe banyere ọnwụ Erọn ha ruru ụjụ nʼihi ya iri ụbọchị atọ.
NUM 21:1 Mgbe eze Kenan, bụ Arad, onye bi na Negev nụrụ na ndị Izrel na-agbaso ụzọ ahụ na-aga obodo Atarim, ọ chịkọtara ndị agha ya, pụkwuru ndị Izrel, lụso ha agha. Ọ dọtara ụfọdụ nʼime ha nʼagha.
NUM 21:2 Mgbe ahụ, ndị Izrel kwere Onyenwe anyị nkwa sị, “Ọ bụrụ na ị ga-enyere anyị aka imeri eze Arad na ndị ya, anyị ga-ebibi obodo ha niile kpamkpam.”
NUM 21:3 Onyenwe anyị ṅara ntị nʼarịrịọ ha, nyere ha aka imeri ndị Kenan ahụ. Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bibiri obodo ha niile, na ndị niile bi nʼime ya. Ya mere, aha a kpọrọ ebe ahụ niile bụ Homa.
NUM 21:4 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel sitere nʼugwu Hor bilie ije ha, si ụzọ gawara Osimiri Uhie, ka ha nwee ike gaa gburugburu ala ndị Edọm. Ma ndị Izrel enweghị ntachiobi oge niile ha nọ nʼije a.
NUM 21:5 Ha kwuru okwu megide Chineke na Mosis sị, “Gịnị mere i ji site nʼala Ijipt kpọpụta anyị ka anyị nwụsịa nʼọzara a? Lee na nri ọbụla adịghị nʼebe a, mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa, ike iri mánà a na-enweghị isi agwụkwala anyị.”
NUM 21:6 Ya mere, Onyenwe anyị zitere agwọ ọjọọ na-ata ata nʼetiti ha. Agwọ ndị a tagbukwara ọtụtụ nʼime ụmụ Izrel.
NUM 21:7 Mgbe ahụ, ndị Izrel bịakwutere Mosis sị ya, “Anyị emehiela, nʼihi na anyị ekwuluola Onyenwe anyị, kwulukwaa gị onwe gị. Biko rịọrọ anyị Onyenwe anyị ka o wezugara anyị agwọ ọjọọ ndị a.” Mosis rịọrọ arịrịọ nʼihi ha.
NUM 21:8 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpụọ otu agwọ yiri agwọ ndị a. Kwụba ya nʼọnụ ogologo osisi nke ị ga-amanye nʼala ebe mmadụ niile ga-ahụ ya anya. Onye ọbụla agwọ ọjọọ a tara ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ewelite anya ya elu lekwasị agwọ ahụ ị kwụbara nʼelu osisi ahụ.”
NUM 21:9 Ya mere, Mosis ji bronz kpụta agwọ yiri otu nʼime agwọ ndị ahụ, tinye ya nʼọnụ osisi dị ogologo. Onye ọbụla kwa agwọ ahụ tara nke welitere anya ya elu lee agwọ bronz ahụ anya, dịkwara ndụ.
NUM 21:10 Ụmụ Izrel biliri njem, manye ụlọ ikwu ha na Obot.
NUM 21:11 Ha sikwa nʼObot bilie njem, maa ụlọ ikwu ha na Iye Abarim, nʼọzara ahụ nke chere ihu nʼobodo Moab, nʼụzọ ọwụwa anyanwụ.
NUM 21:12 Ha si nʼebe ahụ bilie njem, manye ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Zered.
NUM 21:13 Ha sitekwara nʼebe ahụ bilie njem, maa ụlọ ikwu ha nʼofe iyi Anọn nke dị nʼọzara ruru nʼoke ala ndị Amọrait. Iyi Anọn bụ oke ala Moab, nʼetiti ndị Moab na ndị Amọrait.
NUM 21:14 Nʼihi nke a, nʼAkwụkwọ Agha dị iche iche nke Onyenwe anyị na-asị, “Waheb nʼime Sufa ya na ndagwurugwu niile Anọn
NUM 21:15 na mgbadata ndagwurugwu ndị ahụ nke gbasapụrụ ruo nʼebe Ar dị, nke tọgbọrọ nʼoke ala Moab.”
NUM 21:16 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel niile biliri njem bịarute Bịa bụ nʼolulu mmiri ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis iwu sị, “Kpọkọtaa ndị Izrel niile, nʼihi na m na-aga inye ha mmiri.”
NUM 21:17 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bụrụ abụ a. “Sọpụta gị olulu mmiri! Bụọnụ abụ banyere mmiri a!
NUM 21:18 Olulu mmiri ụmụ ndị eze gwuru nke ndị ndu anyị doziri. Mkpara eze ha na mkpara ha, ka ha ji gwuo ya.” Emesịa, ha hapụrụ ọzara ahụ, gaa nʼihu ruo nʼobodo Matana.
NUM 21:19 Ha si Matana jeruo Nahaliel, si Nahaliel jeruo Bamot.
NUM 21:20 Sitekwa Bamot rute na ndagwurugwu ahụ dị nʼọhịa Moab, ruo nʼugwu Pisga, nke chere ihu nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.
NUM 21:21 Ndị Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn, eze ndị Amọrait, sị ya,
NUM 21:22 “Biko, kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Anyị agaghị atụgharị banye nʼime ala ubi gị maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmiri site nʼolulu mmiri ọbụla dị nʼala gị. Anyị ga-eje nʼokporoụzọ eze tutu ruo mgbe anyị ga-agabiga oke ala gị.”
NUM 21:23 Ma Saịhọn ekweghị na ụmụ Izrel ga-esi nʼoke ala ya gafee. Ọ chịkọtara ndị agha ya niile, zọpụ ije ibu agha megide ndị Izrel nʼime ọzara ahụ. Mgbe o rutere Jehaz, ọ lụsoro Izrel agha.
NUM 21:24 Ma Izrel jiri mma agha gbuo ya. Nwetara onwe ha ala ya, site nʼiyi Anọn ruo nʼiyi Jabọk, gamiekwa rute nʼoke ala ha na ndị Amọn, ha kwụsịrị nʼihi nʼoke ala ndị Amọn siri ike karịa.
NUM 21:25 Ndị Izrel lụgburu obodo niile nke ndị Amọrait bichie nʼime ha, tinyere Heshbọn na obodo nta niile gbara ya gburugburu.
NUM 21:26 Heshbọn bụ isi obodo Saịhọn, eze ndị Amọrait onye busoro eze naara achị Moab agha dọta ala ya niile nʼagha ruo Anọn.
NUM 21:27 Ọ bụ nke a mere ndị na-arọ abụ ji kwuo sị, “Bịa na Heshbọn ka e wukwaa ya, ka e mee ka isi obodo eze Saịhọn guzosie ike.
NUM 21:28 “Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn pụọ. Ire ọkụ esitela nʼobodo ukwu Saịhọn, rechapụ obodo Ar, nke dị na Moab, ndị nwe ebe niile dị elu nke Anọn.
NUM 21:29 Ahụhụ dịrị gị Moab! Ndị a lara nʼiyi ka unu bụ, unu ndị Kemosh. Ụmụ ya ndị ikom aghọọla ndị na-enweghị ebe obibi. A dọtala ụmụ ndị inyom nʼagha, nye Saịhọn eze ndị Amọrait.
NUM 21:30 “Ma anyị ebibiela ha, bibie Heshbọn ruo rịị na Dibọn, bibie ha ruo Nofa, ruokwa rịị Medeba.”
NUM 21:31 Ya mere, ụmụ Izrel bichiri nʼala ndị Amọrait.
NUM 21:32 Emesịa, Mosis zipụrụ ndị nnyopụta ka ha ga nyochaa Jeza. Ụmụ Izrel tigburu obodo niile dị gburugburu ya chụpụkwa ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
NUM 21:33 Mgbe ahụ, ha chigharịrị gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụọ izute ha na Edrei.
NUM 21:34 Ma Onyenwe anyị gwara Mosis okwu, sị, “Atụla ya egwu nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait onyeisi obodo ya bụ Heshbọn.”
NUM 21:35 Ya mere, ha gburu ya, tinyere ụmụ ya na ndị agha ya niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ nye ha. Ha nwetakwara ala ha, biri nʼime ya.
NUM 22:1 Ndị Izrel biliri njem bịarute nʼobosara ala Moab. Manye ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Jọdan ebe chere ihu nʼobodo Jeriko.
NUM 22:2 Ma Balak nwa Zipoa ahụlarị ihe niile Izrel mere ndị Amọrait.
NUM 22:3 Oke ụjọ jidere ndị Moab nʼihi na ndị Izrel dị ọtụtụ. Nʼezie, oke ụjọ dị ukwuu jidere ndị Moab nʼihi ụmụ Izrel.
NUM 22:4 Ndị Moab jekwuru ndị okenye Midia sị ha, “Igwe mmadụ ndị a ga-erichapụ ihe niile gbara anyị gburugburu. Ha ga-eripịa ha dịka ehi si erichapụ ahịhịa ndụ dị nʼala.” Ya mere, Balak nwa Zipoa, onye bụ eze ndị Moab nʼoge ahụ,
NUM 22:5 zigara ndị ozi ya ka ha jekwuru Belam, nwa Beoa onye bi nʼobodo ya bụ Petoa, nke dị nso nʼiyi ukwu Yufretis. O ziri ya sị, “Lee otu ndị sitere nʼIjipt pụta. Lee ka ha si kpuchie elu ala a; ugbu a, ha bi nʼakụkụ m.
NUM 22:6 Ugbu a, bịa ka ị bụọrọ m ha ọnụ, nʼihi na ha dị ike karịa m. Ma eleghị anya aga m enwe ike merie ha, ma chụpụkwa ha site nʼala m. Nʼihi na amaara m na ndị ọbụla ị gọziri bụ ndị a gọziri agọzi, ndị ọbụla ị bụrụ ọnụ ga-anọgide bụrụ ndị a bụrụ ọnụ.”
NUM 22:7 Ndị ozi o zigara bụ ndị okenye obodo Moab na Midia. Ha ji ego ịjụta ase nʼaka ha. Mgbe ha ruru, ha ziri Belam ozi Balak ziri.
NUM 22:8 Belam gwara ha okwu sị, “Nọdụnụ nʼebe a nʼabalị a. Aga m ewetara unu ọsịsa ọbụla Onyenwe anyị nyere m.” Ya mere, ndị ozi ahụ si Moab nọnyeere ya.
NUM 22:9 Nʼabalị ahụ, Chineke bịakwutere Belam jụọ ya sị, “Ndị ikom ndị a bịara ileta gị, ha bụ ndị ole?”
NUM 22:10 Belam sịrị Chineke, “Balak nwa Zipoa eze Moab zitere m ozi sị m,
NUM 22:11 ‘Otu ndị esitela nʼala Ijipt pụta, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Achọrọ m ka ị bịa bụọrọ m ha ọnụ. Ma eleghị anya aga m enwe ike lụso ha agha, ma chụpụkwa ha.’ ”
NUM 22:12 Ma Chineke sịrị Belam, “Esola ha aga! Ị gaghị abụ ndị a ọnụ, nʼihi na ha bụ ndị a gọziri agọzi.”
NUM 22:13 Mgbe chi bọrọ, Belam biliri gwa ndị ozi Balak sị ha, “Laghachinụ nʼobodo unu nʼihi na Onyenwe anyị ekweghị ka m soro unu.”
NUM 22:14 Ya mere, ndị ozi Moab laghachikwuru Balak gwa ya sị, “Belam jụrụ iso anyị lọghachi.”
NUM 22:15 Balak nwara ike ya ọzọ. Nʼoge a, o zipụrụ ụmụ eze ndị dị ọtụtụ na ndị a maara aha ha karịa ndị mbụ.
NUM 22:16 Ha jiri ozi a bịakwute Belam sị ya, “Ihe a ka Balak nwa Zipoa sị anyị zie gị, Ọ sị gị ekwela ka ihe ọbụla gbochie gị ịbịakwute m.
NUM 22:17 Nʼihi na aghaghị ịsọpụrụ gị nʼebe ọ dị ukwuu m, mekwaa ihe ọbụla ị sị m mee. Naanị bịa ka ị bụọrọ m ndị a ọnụ.”
NUM 22:18 Ma Belam zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na Balak enye m ụlọeze ya nke juputara nʼọlaọcha na ọlaedo, apụghị m ime ihe ọbụla dị ukwuu maọbụ nke nta ịgabiga iwu Onyenwe anyị bụ Chineke m.
NUM 22:19 Ma otu ọ dị, nọọnụ ka chị bọọ dịka ndị ọzọ ahụ mere ka m nwee ike chọpụta ma ọ dị ihe Onyenwe anyị ga-atụkwasị nʼihe o kwuru na mbụ.”
NUM 22:20 Nʼabalị ahụ, Chineke gwara Belam okwu sị ya, “Ebe ọ bụ na ndị a bịara ịkpọ gị oku, bilie soro ha gaa, kama jikere ikwu naanị okwu m ga-etinye gị nʼọnụ.”
NUM 22:21 Ya mere, mgbe chi echi ya bọrọ, Belam rigooro nʼelu ịnyịnya ibu ya soro ụmụ eze Moab gaa.
NUM 22:22 Ma iwe were Chineke nʼihi na ọ na-aga, ma mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri ụzọ igbochi ya. Belam na ndị odibo ya abụọ nọ na-elu ịnyịnya ibu ya.
NUM 22:23 Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzochiri nʼụzọ, jide mma a mịpụtara amịpụta nʼaka ya, ịnyịnya ibu ahụ chigharịrị onwe ya hapụ okporoụzọ, tinye isi nʼọhịa. Ma Belam tiri ya ihe ịchụghachi ya nʼụzọ.
NUM 22:24 Nʼoge a, mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri nʼụzọ dị warawara, nke dị nʼetiti mgbidi ogige ubi vaịnị abụọ.
NUM 22:25 Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị, o tinyere isi nʼahụ mgbidi ogige ubi ahụ, chọọ isite nʼebe ahụ gafee. Mgbe ọ na-eme nke a, o mere ka mgbidi ahụ chihịapụ Belam ụkwụ. Ya mere Belam tiri ịnyịnya ibu ahụ ihe ọzọ.
NUM 22:26 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gakwara nʼihu nʼokporoụzọ ahụ nọchie ụzọ ahụ ebe dị nnọọ mkpakọta, ebe ịnyịnya ibu ahụ na-agaghị enwe ike gafee, maọbụ ichigharị aka nri maọbụ aka ekpe.
NUM 22:27 Nʼihi nke a, mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị o dinara ala nʼokporoụzọ. Nʼoke iwe, Belam ji mkpara dị ya nʼaka tie ya ihe ọzọ.
NUM 22:28 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mere ka ịnyịnya ibu ahụ kwuo okwu. Ọ jụrụ Belam ajụjụ sị, “Gịnị ka m mere gị i ji tie m ihe ugboro atọ?”
NUM 22:29 Belam zara ịnyịnya ibu ahụ sị, “Ọ bụ nʼihi na i meela ka m dị ka onye nzuzu! Nʼezie, a sị na m ji mma agha nʼaka m, agaara m egbu gị.”
NUM 22:30 Ịnyịnya ibu ahụ gwara Balam okwu ọzọ sị ya, “Ọ bụ na mụ onwe m abụghị ịnyịnya ibu gị nke ị na-anọ nʼelu ya ogologo oge ndị a niile? Ọ dịla mgbe m si otu a meso gị omume nʼime ndụ m niile?” Belam zara sị ya, “Ee.”
NUM 22:31 Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị meghere anya Belam. Ọ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o ji mma agha ya guzochie ụzọ. Belam dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼala nʼihu ya.
NUM 22:32 Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ jụrụ Belam ajụjụ sị, “Gịnị mere i ji tie ịnyịnya ibu gị ihe ugboro atọ? Abịara m igbochi gị ka ịla nʼiyi dị na-eche gị ghara irute gị.
NUM 22:33 Ugboro atọ ka ịnyịnya ibu a hụrụ m, ma site nʼihu m wezuga onwe ya. A sị na ọ bụghị ntụgharị ọ tụgharịrị site nʼebe m nọ, nʼezie, ugbu a, a gara m egbu gị ma hapụ ịnyịnya ibu gị ndụ.”
NUM 22:34 Nʼoge a, Belam sịrị mmụọ ozi Onyenwe anyị, “Emehiela m. Amaghị m na i guzo nʼụzọ igbochi m. Ọ bụrụ iwe na-ewe gị, ejikeere m ịlaghachi azụ.”
NUM 22:35 Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị Belam, “Soro ndị ikom a gaa, ma kwuo naanị ihe m sị gị kwuo.” Ya mere, Belam soro ndị ozi eze Balak gaa.
NUM 22:36 Mgbe Balak nụrụ na Belam nọ nʼụzọ na-abịa, ọ pụrụ gaa izute Belam nʼotu obodo Moab nke dị nʼọnụ mmiri Anọn, nke dị na ngwụcha oke ala ya.
NUM 22:37 Mgbe ọ bịarutere, Balak jụrụ Belam ajụjụ sị ya, “Eziri m gị ozi ka ị bịa ngwangwa, gịnị mere ị bịaghị? Ọ bụ na m enweghị ike ịsọpụrụ gị?”
NUM 22:38 Belam zaghachiri, “Lee, Abịakwutelam gị ugbu a, ma enweghị m ike ikwu ihe ọbụla dị m mma. Ọ bụ naanị ihe Chineke tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu.”
NUM 22:39 Belam sooro Balak gaa Kiriat Huzot.
NUM 22:40 Balak jiri ehi na atụrụ chụọ aja. O nyere Belam ụfọdụ, nyekwa ma ndị ozi eze ndị ya na ha nọ nʼebe ahụ.
NUM 22:41 Nʼụtụtụ echi ya, Balak kpọọrọ Belam, duru ya rigoo Bamot Baal. O sitere nʼebe ahụ hụ nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.
NUM 23:1 Belam sịrị, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa nʼebe a. Kwadokwaara m oke ehi asaa na ebule asaa.”
NUM 23:2 Balak mezuru dịka Belam gwara ya. Ha abụọ gburu otu oke ehi na otu nwa ebule nʼebe ịchụ aja asaa ahụ nʼotu na otu.
NUM 23:3 Mgbe ahụ, Belam gwara Balak sị, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ aja gị ka m gaa nʼihu chọpụta ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-ezute m. Aga m agwa gị ihe ọbụla o kpughere m.” Ya mere, Belam rigooro nʼebe ọhịa na-adịghị.
NUM 23:4 Chineke zutere ya nʼebe ahụ. Belam gwara ya sị, “Edoziela m ebe ịchụ aja asaa, gbukwaa otu oke ehi na otu ebule nʼelu ha niile nʼotu na otu.”
NUM 23:5 Nʼoge a, Onyenwe anyị tinyere Belam ozi nʼọnụ sị ya, “Laghachi gaa zie Balak ozi a.”
NUM 23:6 Mgbe Belam lọghachiri ọ hụrụ ya ka o guzoro nʼakụkụ ihe aja ya ndị ahụ, ya na ndịisi Moab niile.
NUM 23:7 Nke a bụ ozi Belam ziri: “Balak esitela nʼobodo Aram kpọta m. Eze Moab esitela nʼọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ kpọta m. Ọ sịrị m, bịa bụọrọ m Jekọb ọnụ bịa kwutọọ Izrel.
NUM 23:8 M ga-esi aṅaa bụọ onye Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ? M ga-esi aṅaa kọchaa onye Onyenwe anyị na-akọchaghị?
NUM 23:9 Esitela m nʼelu nkume ndị a hụ ha. Elegidere m ha anya site nʼugwu ahụ, hụ na ha bụ ndị biri onwe ha, ndị dị iche site nʼetiti mba niile ọzọ.
NUM 23:10 Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị? Maọbụ gụta ole otu ụzọ nʼime nkewa anọ nke Izrel dị. Ọ ga-atọ m ụtọ ịnwụ ụdị ọnwụ ndị na-eme ezi omume. Ka ọgwụgwụ ndụ m bụrụ ihe nwere ike iyi nke ha!”
NUM 23:11 Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!”
NUM 23:12 Ma Belam zaghachiri sị ya, “Ọ bụghị ihe Onyenwe anyị tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu?”
NUM 23:13 Mgbe ahụ, Balak sịrị ya, “Soro m bịa nʼebe ọzọ ebe ị ga-ahụ ha; ọ bụ naanị nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ha ka ị ga-ahụ, ị gaghị ahụ ha niile. Site nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”
NUM 23:14 Ya mere, eze Balak duuru Belam gaa nʼọhịa Zofim, nʼelu ugwu Pisga, wuo ebe ịchụ aja asaa nʼebe ahụ. O jikwa otu oke ehi, otu oke ehi, na otu ebule, otu ebule, chụọ aja nʼebe ịchụ aja ndị ahụ.
NUM 23:15 Belam sịrị Balak, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ ihe aja gị, ebe mụ onwe m ga-ezute ya nʼofe nke ọzọ.”
NUM 23:16 Ma Onyenwe anyị zutere Belam gwa ya ihe ọ ga-ekwu sị ya, “Laghachikwuru Balak zie ya ozi a.”
NUM 23:17 Ya mere, ọ lọghachiri azụ nʼebe ahụ Balak na ụmụ eze Moab guzoro nʼakụkụ ihe aja ha. Balak jụrụ ya sị, “Gịnị ka Onyenwe anyị sịrị?”
NUM 23:18 Ma Belam zaghachiri sị ya: “Bilie ọtọ Balak, nụrụ ozi. Ṅaa ntị nʼokwu m, gị nwa Zipoa.
NUM 23:19 Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ. Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ. O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru? O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere?
NUM 23:20 Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha. Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya!
NUM 23:21 “O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb, ahụghịkwa mwute ọbụla nʼIzrel. Onyenwe anyị Chineke ha nọnyeere ha. Iti mkpu nke Eze dịkwa nʼetiti ha.
NUM 23:22 Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt. Ha dị ike dịka ehi ọhịa.
NUM 23:23 Ọ dịghị mgbaasị ga-emegide ha. Ọ dịkwaghị ịgba afa a pụrụ iji megide Izrel. Nʼihi na ugbu a, ihe dị otu a ka a ga-ekwu banyere Jekọb na Izrel. ‘Lee, ihe Chineke mere ha.’
NUM 23:24 Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm, ha na-enugharị onwe ha dịka ọdụm, nke na-adịghị edina ala tutu o richaa ihe o gburu, ma ṅụọkwa ọbara ihe ahụ o tigburu!”
NUM 23:25 Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Abụla ha ọnụ ma ọlị, ma ọ bụkwanụ gọzie ha ma ọlị.”
NUM 23:26 Ma Belam zaghachiri, “Ọ bụ na m agwaghị gị, ihe ọbụla nke Onyenwe anyị ga-ekwu ka m ga-eme?”
NUM 23:27 Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Bịa, aga m akpọrọ gị gaa nʼebe ọzọ. Eleghị anya ọ ga-amasị Chineke ka i si nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”
NUM 23:28 Ya mere, Balak duuru Belam gaa nʼelu ugwu Peoa nke na-elegide ọzara ahụ anya.
NUM 23:29 Belam gwara Balak okwu sị ya, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa ọzọ. Doziekwa ụmụ oke ehi asaa na ebule asaa e ji achụ aja.”
NUM 23:30 Balak mere dịka Belam gwara ya. O ji otu oke ehi na otu ebule chụọ aja nʼebe ịchụ aja ahụ nʼotu na otu.
NUM 24:1 Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara.
NUM 24:2 Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya.
NUM 24:3 O buru amụma ndị a sị, “Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta, okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe.
NUM 24:4 Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe.
NUM 24:5 “Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb, ebe obibi gị niile, gị Izrel!
NUM 24:6 “Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ, dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri, dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ, dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.
NUM 24:7 Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta, mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu. “Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag, a ga-ebulikwa alaeze ha elu.
NUM 24:8 “Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha. Ha nwere ike dịka atụ. Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha. Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile, jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha.
NUM 24:9 Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm, dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha? “Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị, ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.”
NUM 24:10 Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a.
NUM 24:11 Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”
NUM 24:12 Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m,
NUM 24:13 ‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’?
NUM 24:14 Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.”
NUM 24:15 Ya mere Belam kwuru okwu ndị a: “Amụma Belam nwa Beoa, amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma,
NUM 24:16 amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke, onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa. Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe.
NUM 24:17 “Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a, ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso. Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie. Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie. Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ikom Shet niile.
NUM 24:18 A ga-emeri Edọm, Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha. Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.
NUM 24:19 Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta. Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.”
NUM 24:20 Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị: “Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile, ma ikpeazụ ya bụ mbibi!”
NUM 24:21 Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya: “E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike, akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ!
NUM 24:22 Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile, mgbe Ashọ ga-adọta unu nʼagha.”
NUM 24:23 Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya: “Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a?
NUM 24:24 Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa. Ha ga-eji ike dobe ndị Eba na ndị Ashọ nʼokpuru ha, ma a ga-ebibikwa ha onwe ha.”
NUM 24:25 Emesịa, Belam biliri laghachi nʼụlọ ya, ma Balak gbasoro ụzọ nke ya.
NUM 25:1 Mgbe Izrel bi na Shitim, ndị ikom ha malitere isoro ndị inyom Moab na-akwa iko.
NUM 25:2 Ndị inyom a kpọrọ ha ka ha bịa soro na mmemme ịchụ aja nye chi ha niile. Ndị Izrel riri nri ihe aja ahụ, kpọọkwa isiala nye chi ndị a niile.
NUM 25:3 Ya mere, ndị Izrel sonyere na-akpọ isiala nye chi Baal nke Peoa. Nke a mere ka iwe Onyenwe anyị nwuru ọkụ megide ha.
NUM 25:4 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Duru ndị ndu ebo niile nke Izrel gbuo ha ma kwụnye ha nʼosisi nʼihu Onyenwe anyị nʼetiti ehihie, ka oke iwe Onyenwe anyị dị ọkụ ghara ịbịakwasị ndị Izrel.”
NUM 25:5 Ya mere, Mosis sịrị ndị ọkaikpe Izrel, “Onye ọbụla nʼime unu aghaghị igbu ndị unu, bụ ndị jikọtara onwe ha na Baal nke Peoa.”
NUM 25:6 Mgbe ahụ, otu nwoke onye Izrel kpọbatara nʼime ụlọ ikwu otu nwanyị onye Midia, nʼihu Mosis na nzukọ Izrel niile, mgbe ha niile nọ na-akwa akwa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
NUM 25:7 Mgbe Finehaz na Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja hụrụ ihe a, ọ hapụrụ ọgbakọ Izrel. O were ùbe nʼaka ya,
NUM 25:8 soro nwoke ahụ baa nʼime ụlọ, ebe ya na nwaagbọghọ ahụ dina. Ọ mara ha ùbe ahụ, nke si nʼahụ nwoke ahụ gafee mikpuo nʼafọ nwaagbọghọ ahụ. Nke a mere ka ihe otiti ahụ na-emegide ndị Izrel kwụsị.
NUM 25:9 Ma tupu ihe otiti ahụ akwụsị, ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ruru iri puku abụọ na anọ (24,000) anwụọlarị.
NUM 25:10 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
NUM 25:11 “Finehaz nwa Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja, emeela ka iwe m megide Izrel dajụọ. Nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi dịka mụ onwe m banyere idebe nsọpụrụ m nsọ nʼetiti ha, ka m ghara isite nʼịnụ ọkụ nke obi m bibie ha.
NUM 25:12 Ya mere, gwa ya, na m na-eme ka ọgbụgba ndụ udo m dịrị ya.
NUM 25:13 Ya na ụmụ ụmụ ya ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke ịrụ ọrụ nchụaja ga-adịrị, nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi banyere nsọpụrụ nke Chineke ya, si otu a chụọrọ ndị Izrel aja ikpuchi mmehie.”
NUM 25:14 Aha nwoke Izrel ahụ e gburu ya na nwanyị onye Midia ahụ bụ Zimri, nwa Salu, onyendu otu ezinaụlọ nʼebo Simiọn.
NUM 25:15 Aha nwanyị Midia ahụ e gburu bụ Kozbi, nwa nwanyị Zua, onye bụ otu nʼime ndịisi ezinaụlọ na Midia.
NUM 25:16 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 25:17 “Mesoo ndị Midia mmeso dịka ndị iro. Gbukwaa ha.
NUM 25:18 Nʼihi na ha mesoro unu mmeso dịka ndị iro mgbe ha ji ụzọ aghụghọ ghọgbuo unu nʼokwu Peoa, na nʼokwu Kozbi nwanne ha nwanyị, bụ nwa nwanyị otu nʼime ndịisi Midia, onye e gburu mgbe ihe otiti ahụ bịara nʼihi okwu Peoa.”
NUM 26:1 Mgbe ihe otiti ahụ niile gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis na Elieza nwa Erọn, onye nchụaja okwu sị ha,
NUM 26:2 “Gaanụ gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ nzukọ niile nke ụmụ Izrel dịka ezinaụlọ ha si dị; ndị niile gbara iri afọ abụọ gafee. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị nwere ike ije agha.”
NUM 26:3 Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha,
NUM 26:4 “Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.” Ndị a bụ ndị Izrel si Ijipt pụta:
NUM 26:5 Ụmụ ụmụ Ruben, ọkpara Izrel, bụ ndị a: site na Hanok, ikwu Hanok, site na Palu, ikwu Palu,
NUM 26:6 site na Hezrọn, ikwu Hezrọn site na Kami, ikwu Kami
NUM 26:7 Ndị a bụ agbụrụ Ruben. Ọnụọgụgụ ha dị iri puku anọ, puku atọ na narị asaa na iri atọ (43,730).
NUM 26:8 Nwa Palu bụ Eliab,
NUM 26:9 ụmụ Eliab bụ Nemuel, Datan na Abiram. Datan na Abiram bụ ndị ndu ọgbakọ ahụ nupuru isi megide Mosis na Erọn. Ha sonyere ndị ahụ so Kora mgbe ha nupuru isi megide Onyenwe anyị.
NUM 26:10 Ala meghere ọnụ ya, loo ha na Kora, ma ọkụ rechapụrụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ọzọ ahụ sonyere ha. Ọnwụ ha ghọrọ ihe ịdọ aka na ntị.
NUM 26:11 Otu ọ dị, ndị niile si nʼezinaụlọ Kora anwụchaghị.
NUM 26:12 Ụmụ ụmụ Simiọn dịka ikwu ha si dị bụ, site na Nemuel, ikwu Nemuel, site na Jamin, ikwu Jamin, site na Jakin, ikwu Jakin,
NUM 26:13 Site na Zera, ikwu Zera, site na Shaul, ikwu Shaul.
NUM 26:14 Ndị a bụ ndị agbụrụ Simiọn. Ọnụọgụgụ ndị ikom ha dị iri puku abụọ, puku abụọ na narị abụọ (22,200).
NUM 26:15 Ụmụ ụmụ Gad dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Zefọn, site na Zefọn, ikwu Hagi, site na Hagi, ikwu Shuni, site na Shuni,
NUM 26:16 ikwu Ozni, site na Ozni, ikwu Eri, site na Eri,
NUM 26:17 ikwu Arodi, site na Arodi, ikwu Areli, site na Areli,
NUM 26:18 Ndị a bụ agbụrụ Gad. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ na narị ise (40,500).
NUM 26:19 Ụmụ ndị ikom Juda abụọ, Ịa na Onan, nwụrụ nʼala Kenan.
NUM 26:20 Ma ụmụ ụmụ Juda ndị ọzọ, dịka ikwu ha dị iche iche si dị bụ ndị a: ikwu Shela, site na Shela, ikwu Perez, site na Perez, ikwu Zera, site na Zera.
NUM 26:21 Ikwu abụọ ọzọ si nʼagbụrụ Perez bụ ndị a: Ikwu Hezrọn, site na Hezrọn, Ikwu Hamul, site na Hamul.
NUM 26:22 Ndị a bụ agbụrụ Juda. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku asaa, puku isii na narị ise (76,500).
NUM 26:23 Ụmụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Tola, site na Tola, ikwu Pua, site na Pua
NUM 26:24 ikwu Jashub, site na Jashub, ikwu Shịmrọn, site na Shịmrọn.
NUM 26:25 Ndị a bụ agbụrụ Isaka. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị atọ (64,300).
NUM 26:26 Ụmụ ụmụ Zebụlọn dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ndị Sered, site nʼikwu Sered, ndị Elọn, site nʼikwu Elọn, ndị Jaliil, site nʼikwu Jaliil.
NUM 26:27 Ndị a bụ agbụrụ Zebụlọn. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii na narị ise (60,500).
NUM 26:28 Ụmụ ụmụ Josef dịka ha si dị nʼagbụrụ Manase na Ifrem bụ ndị a:
NUM 26:29 Ụmụ ụmụ Manase bụ ndị a: ndị Makia, site nʼikwu Makia. Makia bụ nna Gilead. Ikwu Gilead, site na Gilead.
NUM 26:30 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Gilead: ikwu Leza, site na Leza, ikwu Helek, site na Helek.
NUM 26:31 Ikwu Asriel, site na Asriel. Ikwu Shekem, site na Shekem.
NUM 26:32 Ikwu Shemida, site na Shemida, ikwu Hefa, site na Hefa.
NUM 26:33 (Hefa mụtara nwoke a na-akpọ Zelofehad. Ma Zelofehad amụtaghị nwoke ọbụla kama ndị inyom ndị a ka ọ mụtara, Mahla, na Noa, na Hogla, na Milka, na Tịaza.)
NUM 26:34 Ndị a bụ agbụrụ Manase. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku abụọ na narị asaa (52,700).
NUM 26:35 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Ifrem dịka ikwu ha si dị: ikwu Shutela site na Shutela, ikwu Beka site na Beka, ikwu Tahan site na Tahan.
NUM 26:36 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Shutela: ikwu Eran site na Eran.
NUM 26:37 Ndị a bụ agbụrụ Ifrem. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku atọ, puku abụọ na narị ise (32,500). Ndị a bụ ụmụ ụmụ Josef dịka ikwu ha si dị.
NUM 26:38 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Benjamin dịka ikwu ha si dị: ikwu Bela site na Bela, ikwu Ashbel site Ashbel, ikwu Ahiram site na Ahiram.
NUM 26:39 Ikwu Shufam site na Shufam, ikwu Hufam site na Hufam.
NUM 26:40 Ụmụ ụmụ Bela site na Aad, na Naaman bụ, ikwu Aad site na Aad, ikwu Neeman site na Neeman.
NUM 26:41 Ndị a bụ agbụrụ Benjamin. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị isii (45,600).
NUM 26:42 Ụmụ ụmụ Dan dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Shuham, site na Shuham. Ndị a bụ naanị ikwu dị na Dan.
NUM 26:43 Ha niile si nʼagbụrụ Shuham. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị anọ (64,400).
NUM 26:44 Ụmụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Imna site na Imna, ikwu Ishvi, site na Ishvi, ikwu Beriya, site na Beriya.
NUM 26:45 Ikwu e nwere site nʼụmụ ụmụ Beriya bụ ndị a: ikwu Heba, site na Heba, ikwu Malkiel, site na Malkiel.
NUM 26:46 Asha mụtakwara otu nwa nwanyị aha ya bụ Sera.
NUM 26:47 Ndị a bụ agbụrụ Asha. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).
NUM 26:48 Ụmụ ụmụ Naftalị dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Jaziil, site na Jaziil, ikwu Guni, site na Guni,
NUM 26:49 ikwu Jeza, site na Jeza, ikwu Shilem, site na Shilem.
NUM 26:50 Ndị a si nʼagbụrụ Naftalị. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị anọ (45,400).
NUM 26:51 Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom niile tozuru ije agha nʼIzrel dị narị puku isii, otu puku na narị asaa, na iri atọ (601,730).
NUM 26:52 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 26:53 “Ị ga-ekenye ha ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha dịka ọnụọgụgụ aha ha si dị.
NUM 26:54 Ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ ga-eketa ala dị ukwuu, ma ndị dị nta ga-eketa ala dị nta. Ihe nketa nke onye ọbụla ga-enweta ga-adị ka ọnụọgụgụ ahụ e dere.
NUM 26:55 Lezie anya hụ na e kesara ala ahụ site nʼife nza. Ala ndị ọbụla ga-eketa ga-abụ dịka aha nna ochie ebo ha si dị.
NUM 26:56 A ga-esite nʼife nza kenye ndị ọbụla ihe nketa nke ha dịka ịdị ukwuu maọbụ ịdị nta ha si dị.”
NUM 26:57 Ndị a bụ ndị Livayị a gụrụ ọnụ dịka ikwu ha si dị, ikwu Geshọn, site na Geshọn, ikwu Kohat, site na Kohat, ikwu Merari, site na Merari.
NUM 26:58 Ndị a sikwa nʼagbụrụ Livayị: ikwu Libni, ikwu Hebrọn, ikwu Mahali, ikwu Mushi, na ikwu Kora. (Kohat bụ nna nna Amram.
NUM 26:59 Aha nwunye Amram bụ Jekobed, nwa nwa Livayị, onye a mụrụ nʼagbụrụ ndị Livayị nʼIjipt. Ọ mụtaara Amram ụmụ ndị a: Erọn na Mosis, na Miriam, nwanne ha nwanyị.
NUM 26:60 Erọn mụtara Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.
NUM 26:61 Ma Nadab na Abihu nwụrụ mgbe ha chere ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị.)
NUM 26:62 Ọnụọgụgụ ụmụ ndị ikom Livayị niile dị otu ọnwa gaa nʼihu dị iri puku abụọ na puku atọ (23,000). Ma a gụnyekọghị ọnụọgụgụ agbụrụ Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel, nʼihi na agbụrụ Livayị enweghị oke ọbụla mgbe e kenyere agbụrụ Izrel niile ihe nketa ha.
NUM 26:63 Ya mere, ndị a bụ nchọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Izrel, dịka Mosis na Elieza onye nchụaja kwadobere gụọ na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.
NUM 26:64 Ma nʼetiti ndị a, o nweghị otu onye ọbụla Mosis na Erọn onye nchụaja gụrụ nʼọnụọgụgụ mgbe ha gụrụ ndị Izrel ọnụ nʼọzara Saịnaị.
NUM 26:65 Nʼihi na Onyenwe anyị gwara ndị Izrel ahụ na ha ga-anwụ nʼime ọzara ahụ. Naanị ndị a hapụrụ ndụ bụ Kaleb, nwa Jefune, na Joshua nwa Nun.
NUM 27:1 Ụmụ ndị inyom Zelofehad nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase bụ ndị si nʼagbụrụ Manase nwa Josef. Aha ndị inyom ndị a bụ: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza. Ha bịara,
NUM 27:2 nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, guzo nʼihu Mosis, na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu niile na ọgbakọ Izrel niile kwuo sị,
NUM 27:3 “Nna anyị Zelofehad nwụrụ nʼọzara ma ọ bụghị otu nʼime ndị sonyere Kora, bụ ndị ahụ zukọtara megide Onyenwe anyị. Ọ nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie nke ya. Ma otu ọ dị, ọ mụtaghị nwoke.
NUM 27:4 Gịnị ga-eme a ga-eji hichapụ aha nna anyị site nʼagbụrụ ya nʼihi na ọ mụtaghị nwoke? Ọ bụ uche anyị na e kwesiri ikenye anyị oke nʼoge a na-enye ụmụnne nna anyị oke.”
NUM 27:5 Ya mere, Mosis butere mkpa ha nʼihu Onyenwe anyị.
NUM 27:6 Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya,
NUM 27:7 “Ihe ụmụ Zelofehad na-ekwu ziri ezi. Ị ghaghị ikenye ha oke nʼetiti ụmụnne nna ha, ma nyefeekwa ha oke ruru nna ha.
NUM 27:8 “Gwa ndị Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwoke, oke niile ruru ya ga-alara nwa ya nwanyị.
NUM 27:9 Ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwanyị, oke ruru ya ga-alara ụmụnne ya ndị nwoke.
NUM 27:10 A sịkwa na o nweghị ụmụnne ndị nwoke, mgbe ahụ oke ya ga-alara ụmụnne nna ya ndị nwoke.
NUM 27:11 Ọ bụrụkwa na o nweghị ndị nwoke bụ ụmụnne nna ya, mgbe ahụ ihe nketa ya ga-alara onye dịkarịrị ya nso nʼikwu ya, ka ọ bụrụ nke ya. Nke a bụ iwu dịrị ndị Izrel niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.’ ”
NUM 27:12 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya: “Gaa rigoro nʼugwu Abarim site nʼebe ahụ lefee anya nʼofe mmiri Jọdan leruo ala ahụ nke m nyere ụmụ Izrel anya.
NUM 27:13 Mgbe i lechasịrị ya, ị ga-anwụ dịka nwanne gị Erọn nwụrụ.
NUM 27:14 Nʼihi na unu nupuru isi nye okwu m nʼọzara Zin, mgbe ọgbakọ ụmụ Izrel sesịrị m okwu. Unu abụọ nupuru isi nʼiwu m ido m nsọ nʼihu ha.” (Ndị a bụ mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.)
NUM 27:15 Mosis zara Onyenwe anyị sị ya,
NUM 27:16 “Ka Onyenwe anyị, Chineke nwe mmụọ nke mmadụ niile, họpụta onyendu ga-elekọta ọgbakọ a.
NUM 27:17 Onye ga na-apụ na-abatakwa nʼihu ha, onye ga na-edu ha pụọ, duru ha batakwa, ka ndị Onyenwe anyị ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ.”
NUM 27:18 Ya mere, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Kpọrọ Joshua, nwa Nun, onye nwere mmụọ Chineke nʼime ya, bikwasị ya aka gị.
NUM 27:19 Mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja, nakwa nʼihu ọgbakọ niile, nyefee ya ọrụ nke ịbụ onyendu nʼihu ha.
NUM 27:20 Nyekwa ha ụfọdụ ikike gị, ka nzukọ niile nke ụmụ Izrel nwee ike rubere ya isi.
NUM 27:21 Ma ya onwe ya ga-eguzo nʼihu Elieza onye nchụaja, onye ga-ajụrụ ya ase site na mkpebi Urim nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-apụ, site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-ana abata. Ma ya onwe ya, ma ndị Izrel niile, tinyekwara nzukọ niile.”
NUM 27:22 Ya mere, Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. O duuru Joshua mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja na ọgbakọ niile.
NUM 27:23 Mosis bikwasịrị aka ya abụọ nʼisi Joshua, rara ya nyefee maka ije ozi ahụ niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
NUM 28:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 28:2 “Nye ndị Izrel iwu a sị ha, ‘Lezienụ anya hụ na unu na-eche nʼihu m, nʼoge niile a kara aka, nri ahụ a na-enye maka onyinye m a na-enye site nʼọkụ, nke isisi ya na-adị m ezi mma.’
NUM 28:3 Sị ha, ‘Nke a bụ onyinye unu na-enye site nʼọkụ nke unu na-eche nʼihu Onyenwe anyị: ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ, ka e jiri ha chụọ aja nsure ọkụ kwa ụbọchị niile.
NUM 28:4 Chụọ otu nwa atụrụ nʼoge ụtụtụ, chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi.
NUM 28:5 Ị ga-ejikwa lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri akwọzi nke a gwọkọtara nʼotu lita mmanụ oliv asụrụ asụ, chụọ aja mkpụrụ ọka.
NUM 28:6 Nke a bụ aja nsure ọkụ ahụ Onyenwe anyị nyere iwu ya nʼugwu Saịnaị na a ga na-achụrụ ya mgbe niile, dịka aja isisi ya dị ezi mma, aja nke a chụrụ site nʼọkụ nye Onyenwe anyị.
NUM 28:7 Mmanya ga-eso aja a ga-abụ otu lita mmanya gbara ụka nʼisi otu atụrụ ọbụla, ị ga-awụsa aja ihe ọṅụṅụ a nʼebe nsọ nye Onyenwe anyị.
NUM 28:8 Nʼoge anyasị, ị ga-ewerekwa nwa atụrụ nke abụọ, ya na otu ụdị aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dị ka i mere nʼụtụtụ, jiri chụọ aja. Nke a bụkwa aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị.
NUM 28:9 “ ‘Nʼụbọchị izuike, jiri ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, ha na aja ihe ọṅụṅụ na aja mkpụrụ ọka e ji lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwaziri mmanụ mee.
NUM 28:10 Nke a bụ aja nsure ọkụ nke Ụbọchị Izuike, tinyere aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ ndị ahụ a na-achụ nʼoge ha.
NUM 28:11 “ ‘Ọzọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa ọbụla, a ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ dị iche, nke a ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ.
NUM 28:12 Tinyere oke ehi ọbụla, ị ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwara mmanụ chụọ aja. Ma lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtakwara mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka maka otu ebule ọbụla.
NUM 28:13 Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, ọ bụ lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtara ya na mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka. A ga-eji ha chụọ aja nsure ọkụ nke isisi ya ga-atọkwa Onyenwe anyị ezi ụtọ.
NUM 28:14 Aja ọbụla a chụrụ ga-enwe aja ihe ọṅụṅụ nke ga-eso ya, lita mmanya abụọ maka otu oke ehi, ihe ji ntakịrị karịa otu lita mmanya nʼisi otu ebule, na otu lita nʼisi otu nwa atụrụ. Nke a ga-abụ aja nsure ọkụ nke a ga-achụ nʼoge ọnwa ọhụrụ ọ bụla, nʼime afọ ọbụla,
NUM 28:15 nʼagbanyeghị aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị, a ga-eche otu mkpi nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mmehie.
NUM 28:16 “ ‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka a ga-edebe Mmemme Ngabiga. Onyenwe anyị.
NUM 28:17 Nʼụbọchị na-eso ya, bụ abalị iri na ise nke ọnwa ahụ ka a ga-eme mmemme. Nʼime abalị asaa ka a ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
NUM 28:18 Nʼụbọchị mbụ mmemme a bidoro, a ga-akpọ nzukọ dị nsọ nke ndị Izrel niile. Ọ dịghị ọrụ siri ike a ga-arụ nʼụbọchị ahụ.
NUM 28:19 Unu ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara naanị otu afọ, otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.
NUM 28:20 Nʼisi otu oke ehi ọbụla, a ga-achụ aja mkpụrụ ọka nke a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, a gwakọtara ya na mmanụ chụọ. Nʼisi ebule ọbụla, lita ụtụ ọka anọ na ọkara.
NUM 28:21 Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, a ga-enye lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma.
NUM 28:22 Tinye otu mkpi nʼihi ịchụ aja mmehie maka ikpuchiri unu mmehie unu.
NUM 28:23 A ga-achụ aja ndị a, tinyere aja ndị ọzọ niile a na-achụ nʼụbọchị niile.
NUM 28:24 A ga-achụ aja ndị a ụbọchị niile nʼime ụbọchị asaa nke mmemme ahụ. Ha ga-abụ aja nke isisi ha dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. A ga-achụ ha, chụkwaa aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị.
NUM 28:25 Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.
NUM 28:26 “ ‘Nʼụbọchị mbụ nke mkpụrụ mbụ, mgbe unu na-eche onyinye ọka ọhụrụ unu nʼihu Onyenwe anyị nʼoge mmemme Izu Asaa, nweenụ mkpọkọta dị nsọ. Unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.
NUM 28:27 Unu ga-achụ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị. Ọ bụ ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ka a ga-eji chụọ aja a.
NUM 28:28 Ihe unu ga-etinye nʼihe ndị a bụ aja mkpụrụ ọka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi otu oke ehi. Lita ụtụ ọka anọ na ọkara, nʼisi otu ebule,
NUM 28:29 na lita ụtụ ọka abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla.
NUM 28:30 Ọzọkwa, a ga-eji otu mkpi chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu.
NUM 28:31 Dozie aja ndị a tinyere aja ihe ọṅụṅụ ha, ya na aja nsure ọkụ na aja mkpụrụ ọka ya na aja ahụ so. Hụkwanụ na anụ ụlọ e ji chụọ aja ndị a bụ ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla.
NUM 29:1 “ ‘Ụbọchị unu ga-egbu opi ike ga-adị nʼabalị mbụ nke ọnwa asaa nʼafọ ọbụla. Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke mmadụ niile. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
NUM 29:2 Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụ aja nsure ọkụ a ga-eji otu oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ. Nke a bụ aja na-adị Onyenwe anyị ezi mma, ma na-esi ya isi ụtọ.
NUM 29:3 Aja mkpụrụ ọka ka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi oke ehi ahụ, lita anọ na ọkara, nʼisi ebule,
NUM 29:4 na lita abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla.
NUM 29:5 Tinyere otu mkpi a ga-eji chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu.
NUM 29:6 Aja ndị a niile bụ nke a ga-etinye nye nʼaja nsure ọkụ a na-achụ kwa ọnwa, na aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, ha na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e depụtara. Ha bụ aja ihe oriri a na-achụrụ Onyenwe anyị, aja nwere isisi dị ụtọ.
NUM 29:7 “ ‘Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwekwa nzukọ dị nsọ. Unu ga-ebudata onwe unu nʼala. O nweghịkwa ụdị ọrụ ọbụla unu ga-arụ.
NUM 29:8 Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, nke isisi ya na-atọ ya ụtọ. A ga-eji otu nwa oke ehi, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja a.
NUM 29:9 Aja mkpụrụ ọka ga-eso ya. A ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ aja nwa oke ehi ahụ. Jiri lita ụtụ ọka anọ na ọkara chụọ aja ebule,
NUM 29:10 jirikwa lita ụtụ ọka abụọ chụọ aja nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.
NUM 29:11 Tinyekwa otu mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie. A ga-atụkwasị nke a nʼaja mkpuchi mmehie a na-achụ, tinyere aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ niile.
NUM 29:12 “ ‘Nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke ụmụ Izrel niile. Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmalite mmemme abalị asaa nʼihu Onyenwe anyị.
NUM 29:13 Cheenụ onyinye a na-enye site nʼọkụ nʼihu Onyenwe anyị nke isisi ya na-atọ ya ụtọ, jirinụ oke ehi iri na atọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị na-enweghị ntụpọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja nsure ọkụ.
NUM 29:14 A ga-atụkwasịkwa aja mkpụrụ ọka nke e ji lita ụtụ ọka isii na ọkara gwakọta ya na mmanụ, nʼisi otu nʼime oke ehi iri na atọ ndị ahụ niile. Lita anọ na ọkara nʼisi otu ebule nʼime ebule abụọ ndị ahụ,
NUM 29:15 ma lita abụọ nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.
NUM 29:16 Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
NUM 29:17 “ ‘Nʼụbọchị abụọ nke mmemme a, a ga-eji oke ehi iri na abụọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
NUM 29:18 Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha, bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
NUM 29:19 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
NUM 29:20 “ ‘Nʼụbọchị nke atọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri na otu, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
NUM 29:21 Ihe ga-eso aja oke ehi na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
NUM 29:22 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
NUM 29:23 “ ‘Nʼụbọchị nke anọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
NUM 29:24 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
NUM 29:25 Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
NUM 29:26 “ ‘Nʼụbọchị nke ise nke mmemme a, ị ga-ewere ụmụ oke ehi itoolu, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
NUM 29:27 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
NUM 29:28 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
NUM 29:29 “ ‘Nʼụbọchị nke isii nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi asatọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
NUM 29:30 Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
NUM 29:31 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
NUM 29:32 “ ‘Nʼụbọchị nke asaa nke mmemme ahụ, were ụmụ oke ehi asaa, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
NUM 29:33 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
NUM 29:34 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
NUM 29:35 “ ‘Nʼụbọchị nke asatọ ndị Izrel niile ga-enwe oke nzukọ. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
NUM 29:36 Chụọ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. Ị ga-eji otu nwa oke ehi, otu ebule na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, chụọ ya.
NUM 29:37 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
NUM 29:38 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
NUM 29:39 “ ‘Tinyere onyinye a na-enye dịka nkwa e kwere si dị, na onyinye afọ ofufu unu, unu ga-akwadoro Onyenwe anyị onyinye ndị a nʼoge mmemme a kara aka unu: aja nsure ọkụ unu, onyinye mkpụrụ ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ na aja udo.’ ”
NUM 29:40 Ya mere Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ịgwa ha.
NUM 30:1 Mosis kpọkọtara ndị ndu ebo Izrel niile gwa ha sị: “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị nyere nʼiwu:
NUM 30:2 Mgbe nwoke ọbụla kwere Onyenwe anyị nkwa, maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ọbụla, ọ gaghị emebi nkwa dị otu a. Kama ọ ga-emezu ihe niile dịka o kwuru ya.
NUM 30:3 “Ọ bụrụ na nwaagbọghọ nọ nʼụlọ nna ya ekwe Onyenwe anyị nkwa maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ọbụla,
NUM 30:4 ọ bụrụ na nna ya anụ mgbe ọ na-ekwe nkwa maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ahụ, ma gba ya nkịtị, onye dị otu a aghaghị imezu nkwa niile ndị ahụ o kwere.
NUM 30:5 Ma ọ bụrụ na nna ya ajụ mgbe ọ nụrụ banyere ya na ọ gaghị emezu nkwa dị otu ahụ, mgbe ahụ, nkwa ahụ maọbụ iyi ọ ṅụrụ ga-abụ ihe efu. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya, nʼihi na nna ya jụrụ na ọ ga-emezu nkwa ya.
NUM 30:6 “Ọ bụrụ na o mesịa lụọ dị, mgbe ọ ṅụsịrị iyi, maọbụ kwee nkwa nzuzu o kwesiri imezu,
NUM 30:7 di ya nụ banyere ya ma gba ya nkịtị nʼụbọchị ahụ ọ nụrụ ya, nkwa ahụ ga-eguzogide, ọ ga-emezu ya.
NUM 30:8 Ma ọ bụrụ na di ya ajụ ịnabata nkwa ahụ, maọbụ ọṅụṅụ iyi nzuzu ahụ, ọjụjụ di ya jụrụ nkwa ahụ ga-eme ka iyi ahụ maọbụ nkwa ahụ ghara ịdị ire. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya.
NUM 30:9 “Ma nkwa ọbụla nke nwanyị di ya nwụrụ maọbụ nwanyị ya na di ya kewara, ihe ọbụla nke o ji ọnụ ya kwuo ka ọ ghaghị imezu.
NUM 30:10 “Ma ọ bụrụ na nwanyị ya na di ya bi e kwee nkwa maọbụ site na kwagide ṅụọ iyi,
NUM 30:11 di ya nụ ihe banyere ya, ma gba nkịtị maọbụ ogbochighị ya, mgbe ahụ, ịṅụ iyi na nkwa ndị ahụ niile nke o kwere ga-eguzo.
NUM 30:12 Ma ọ bụrụ na di ya jụrụ ikwenye ka nkwa ahụ dịgide nʼụbọchị mbụ ọ nụrụ ya, nkwa ahụ maọbụ ọṅụṅụ iyi ahụ aghọọla ihe efu. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya.
NUM 30:13 Ya mere, di ya nwere ike ịjụ, maọbụ mesie nkwa ahụ, maọbụ iyi ahụ ọ ṅụrụ ike.
NUM 30:14 Ọ bụrụ na di ya ekwughị ihe ọbụla site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị ọzọ, mgbe ahụ, o gosiri na o kwenyere ka nwunye ya mezuo nkwa maọbụ iyi ndị ahụ niile.
NUM 30:15 Ọ bụrụ na o mesịa jụ na nwunye ya agaghị emezu nkwa ahụ ọ kwere, ikpe ọmụma niile dị nʼihi emezughị nkwa ahụ dị ya nʼisi.”
NUM 30:16 Ndị a bụ usoro iwu Onyenwe anyị nyere Mosis banyere mmekọrịta nke nwoke na nwunye ya. Ọ metụtakwara nna na nwa ya nwanyị onye bi nʼụlọ ya.
NUM 31:1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 31:2 “Taa ndị Midia ahụhụ, ka i si otu a bọọrọ ndị Izrel ọbọ ihe ọjọọ ndị Midia mere ha. Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-anwụ.”
NUM 31:3 Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị, “Kwadoonụ ndị ikom unu ibuso ndị Midia agha, maka ịbọtara Onyenwe anyị ọbọ.
NUM 31:4 Sinụ nʼebo ọbụla dị nʼIzrel gụpụta puku ndị ikom puku ndị ikom.”
NUM 31:5 Ya mere, e sitere nʼigwe ndị ikom niile nọ nʼIzrel zipụ puku ndị ikom iri na abụọ, ka ha gaa buo agha. Ebo ọbụla zipụrụ otu puku ndị ikom.
NUM 31:6 Mosis zipụrụ ha ibu agha, otu puku, otu puku site nʼebo ọbụla. Finehaz nwa Elieza, onye nchụaja, du ha gaa agha ahụ. O bu ngwongwo si nʼebe nsọ, tinyere opi ike nke a ga-afụ.
NUM 31:7 Ha busoro ndị Midia agha dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Ha gburu onye ọbụla bụ nwoke.
NUM 31:8 Nʼime ndị ha gburu nʼagha ahụ bụ ndị eze Midia ise a na-akpọ Evi, Rekem, Zua, Hua na Reba. Ha jikwa mma agha gbuo Belam nwa Beoa.
NUM 31:9 Ndị agha Izrel chịkọtara ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile nọ nʼala Midia dịka ndị ha dọtara nʼagha. Ha chịkọtara ngwongwo niile ndị Midia ji biri, tinyere igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ ha niile, dịka ihe ha dọtara nʼagha.
NUM 31:10 Emesịa, ha mụnyere ọkụ nʼobodo ndị Midia niile na ebe ha mara ụlọ ikwu, rechapụ ha nʼọkụ.
NUM 31:11 Ha chịkọtara ihe niile ha dọtara nʼagha, ma mmadụ ma anụ ụlọ.
NUM 31:12 Ndị a niile ha dọtara nʼagha na ngwongwo niile ha lụtara nʼagha ka ha buteere Mosis, na Elieza onye nchụaja na ọgbakọ Izrel niile na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan na ncherita ihu Jeriko.
NUM 31:13 Mosis na Elieza onye nchụaja na ndị ndu ọgbakọ Izrel niile pụrụ gaa zute ha nʼazụ ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 31:14 Ma Mosis were iwe megide ndịisi agha, ya bụ ndị ahụ na-achị imerime puku ndị agha, na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị si ibu agha lọta.
NUM 31:15 Mosis jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji debe ndị inyom niile ndị a ndụ?
NUM 31:16 Ọ bụ ndị a bụ ndị gbasoro ndụmọdụ Belam, rafuo ndị Izrel mee ka ha ghọọ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị nʼihe gbasara okwu Peoa. Ọ bụ nke a mere ka nrịa nrịa ọjọọ ahụ na-efe efe dakwasị ndị nke Onyenwe anyị.
NUM 31:17 Ugbu a, gbuonụ ụmụnta ndị nwoke niile, na ndị inyom niile matarala nwoke.
NUM 31:18 Naanị ụmụntakịrị ndị nwanyị ha nke nwoke na-edinabeghị ka unu ga-ahapụ ka ha dịrị ndụ. Unu nwere ike debere onwe unu ndị dị otu a.
NUM 31:19 “Ma ugbu a, unu niile bụ ndị soro gbuo mmadụ, maọbụ bitụ ozu ha aka, unu abatala nʼime ogige Izrel tutu ụbọchị asaa agafee. Nʼoge a, doonụ onwe unu ọcha, dokwaanụ ndị niile unu dọtara nʼagha ọcha, nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa.
NUM 31:20 Debekwanụ uwe niile ọcha, ya na ihe niile e ji akpụkpọ anụ na ajị ewu, maọbụ osisi, mee.”
NUM 31:21 Mgbe ahụ, Elieza onye nchụaja gwara ndị ikom niile ahụ jere agha okwu sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis.
NUM 31:22 Otu ọ dị ọlaedo, ọlaọcha, bronz, igwe, gbamgbam na opu,
NUM 31:23 na ihe ọ bụla ọzọ bụ nke ga-anagide ọkụ, ka a ga-eme ka ọ gabiga site nʼọkụ, mgbe ahụ ọ ga-adịkwa ọcha. Ma aghaghị ịga nʼihu ime ka ha dị ọcha site nʼịsacha ha nʼime mmiri nke nsacha. Ma ihe ọbụla nke na-agaghị anagide ọkụ ka a ga-eji mmiri sachaa, maka ido ya ọcha.
NUM 31:24 Nʼụbọchị nke asaa, unu aghaghị ịsacha uwe unu niile, bụrụ ndị dị ọcha. Mgbe ahụ, unu pụrụ ịlọghachi nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.”
NUM 31:25 Ma Onyenwe anyị sịrị Mosis,
NUM 31:26 “Gị na Elieza onye nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ nke ọgbakọ Izrel niile, ga-agụkọ ihe niile unu dọtara nʼagha chọpụta ọnụọgụgụ mmadụ na anụmanụ.
NUM 31:27 Mgbe ahụ, kee ihe ndị a niile ụzọ abụọ. Ọkara ya ga-abụ nke ndị ikom ahụ niile gara agha, ma ọkara nke ọzọ ka a ga-enye ọgbakọ Izrel niile.
NUM 31:28 Ma Onyenwe anyị nwere oke site nʼoke ndị ahụ jere agha: mmadụ, na ehi niile, na ịnyịnya ibu niile, na atụrụ na ewu niile. Oke Onyenwe anyị bụ otu ụzọ nʼime narị ise ọbụla.
NUM 31:29 Nye Elieza onye nchụaja oke sitere nʼaja a dịka ihe Onyenwe anyị ketara.
NUM 31:30 Otu aka ahụ kwa, site nʼoke ndị Izrel ga-eketa, kee ụtụ. Otu ụzọ nʼime iri ise, maọbụ mmadụ, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, maọbụ igwe anụ ụlọ ụzọ. Were ha nye ndị Livayị, ndị ọ dị nʼaka ilekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ oke nke ha.”
NUM 31:31 Ya mere, Mosis na Elieza onye nchụaja mere dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu.
NUM 31:32 Ihe nweta bụ nke fọdụrụ nʼihe ndị agha lụtara nʼagha bụ ndị a, bụ atụrụ dị narị puku isii, iri puku asaa na puku ise (675,000),
NUM 31:33 Ehi dị iri puku asaa na puku abụọ (72,000),
NUM 31:34 ịnyịnya ibu dị iri puku isii na otu puku (61,000),
NUM 31:35 Ụmụ agbọghọ na-amatabeghị nwoke dị iri puku atọ na puku abụọ (32,000).
NUM 31:36 Ya mere, ọkara e nyere ndị gara lụọ agha dị: Igwe ewu na atụrụ dị narị puku atọ na iri puku atọ na puku asaa na narị ise (337,500).
NUM 31:37 Nʼime ya, ụtụ e nyere Onyenwe anyị site nʼigwe atụrụ ahụ dị narị isii na iri asaa na ise (675).
NUM 31:38 Igwe ehi dị iri puku atọ na puku isii (36,000). Nʼime ya, ihe e nyere Onyenwe anyị bụ iri asaa na abụọ (72).
NUM 31:39 Ịnyịnya ibu dị iri puku atọ na narị ise (30,500). Nke e nyere Onyenwe anyị bụ iri isii na otu (61).
NUM 31:40 Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ dị puku iri na isii (16,000). Ndị e nyere Onyenwe anyị dị iri atọ na abụọ (32).
NUM 31:41 Mosis nyere Elieza bụ onye nchụaja Onyenwe anyị oke nʼihe ndị ahụ niile a tụrụ nʼụtụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
NUM 31:42 Ma ọkara nke ahụ dịrị ndị Izrel, nke Mosis kewapụtara site na nke ndị ikom lụrụ agha.
NUM 31:43 Ọkara nke nzukọ dị, igwe ewu na atụrụ, narị puku atọ, iri puku atọ, puku asaa na narị ise (337,500),
NUM 31:44 igwe ehi, iri puku atọ na isii (36,000),
NUM 31:45 ịnyịnya ibu, iri puku atọ na narị ise (30,500),
NUM 31:46 ụmụ agbọghọ, puku iri na isii (16,000).
NUM 31:47 Site nʼoke ndị Izrel Mosis họpụtara otu ụzọ nʼime iri ise, ma mmadụ ma anụ ụlọ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. O nyere ha ndị Livayị na-elekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị mmadụ na anụ ụlọ ndị a.
NUM 31:48 Mgbe ahụ, ndịisi agha niile na ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha bịakwutere Mosis,
NUM 31:49 sị ya, “Ndị ohu gị agụọla ndị niile gara agha nọ nʼokpuru anyị, chọpụta na o nweghị onye ọbụla a na-achọ achọ.
NUM 31:50 Ya mere, anyị wetaara Onyenwe anyị onyinye site nʼihe anyị kwatara nʼagha. Onyinye anyị bụ ihe onye ọbụla nwetara, ihe ọlaedo a na-agba nʼụkwụ na mgbaaka, na ọlaaka ikike, na ọlantị na ihe iyi nʼolu niile, i ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onwe anyị nʼihu Onyenwe anyị.”
NUM 31:51 Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị ahụ bụ ihe a kpụrụ akpụ site nʼaka ha.
NUM 31:52 Ịdị arọ nke ihe ọlaedo niile nke ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha, nke Mosis na Elieza chere nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye, dị narị kilogram na iri itoolu.
NUM 31:53 Ndị ahụ lụrụ agha ahụ nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha debeere onwe ha.
NUM 31:54 Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị a dị iche site nʼaka ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha na narị ndị agha. E webatara onyinye ndị a nʼụlọ nzute, debe ha nʼihu Onyenwe anyị ka ọ bụrụ ihe ncheta nye Onyenwe anyị nʼihi ndị Izrel niile.
NUM 32:1 Mgbe ndị Izrel rutere ala Jeza na Gilead, ndị ebo Ruben na Gad ndị nwere ọtụtụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ chọpụtara na ala ahụ dị mma nke ukwuu maka ịzụ anụ ụlọ.
NUM 32:2 Ya mere, ha bịakwutere Mosis na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ Izrel, sị ha,
NUM 32:3 “Ala ndị a: Atarọt, Dibọn, Jeza, Nimra, Heshbọn, Eleale, Sebam, Nebo, na Beon,
NUM 32:4 bụ ala nke Onyenwe anyị meriri nʼagha nʼihu nzukọ Izrel, dị mma maka ịzụ anụ ụlọ. Anyị onwe anyị kwa nwere igwe ewu na atụrụ.
NUM 32:5 Ọ bụrụ na anyị achọtala amara nʼihu unu, biko, kwerenụ ka akụkụ ala a bụrụ ihe nketa nke anyị bụ ohu unu. Unu emekwala ka anyị soro ndị Izrel gafee nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri Jọdan.”
NUM 32:6 Mosis jụrụ ndị Gad na Ruben ajụjụ sị, “Unu na-ekwu na unu chọrọ ịnọ nʼebe a mgbe ụmụnna unu ndị ikom niile ga-agafe osimiri Jọdan ịlụ agha niile ahụ dị na-eche ha?
NUM 32:7 Ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ji eme ka ndị Izrel daa mba ghara ịgafe banye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyerela ha?
NUM 32:8 Otu a ka nna unu ha mere mgbe m si Kadesh Banea zipụ ha inyocha ala ahụ.
NUM 32:9 Mgbe ha letasịrị ala ahụ si na Ndagwurugwu Eshkọl lọghachi, ha mere ka obi ndị Izrel niile daa mba ịbanye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha.
NUM 32:10 Nʼihi nke a Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha nʼụbọchị ahụ. Ọ ṅụrụ iyi kwuo sị,
NUM 32:11 ‘Nʼihi na unu jụrụ iji obi unu niile gbasoo m, o nweghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ o si nʼala Ijipt kpọpụta, ndị gbara iri afọ abụọ rigoo, ga-ahụ ala ahụ m kwere Ebraham na Aịzik na Jekọb nkwa inye ha.’
NUM 32:12 Naanị ndị ọṅụṅụ iyi a na-emegideghị bụ Kaleb, nwa Jefune onye Keniz, na Joshua nwa Nun, nʼihi na ha jiri obi ha niile sogide Onyenwe anyị.
NUM 32:13 Iwe Onyenwe anyị dịịrị ọkụ megide Izrel, o mere ka ha wagharịa nʼọzara iri afọ anọ, tutu ruo mgbe ọgbọ ahụ niile nke mere ihe ọjọọ nʼanya ya nwụchara.
NUM 32:14 “Ma lee unu ugbu a, agbụrụ ndị mmehie, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka unu na-eme! Unu na-achọ ime ka iwe dị ukwuu wee Onyenwe anyị megide ndị Izrel.
NUM 32:15 Ọ bụrụ na unu ajụ iso Onyenwe anyị ugbu a, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ndị Izrel nọgide nʼọzara. Mbibi na ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha ga-abụkwa nke unu ji aka unu kpatara ha.”
NUM 32:16 Ma ha zara sị ya, “Ọ gaghị adị otu a! Anyị ga-ewuru anụ ụlọ anyị ụlọ, tinye igwe ewu na atụrụ anyị nʼime ha. Anyị ga-ewukwara ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị obodo ebe ha ga-anọ.
NUM 32:17 Ma anyị onwe anyị ga-eburu ngwa agha anyị, buru ndị Izrel niile ọzọ ụzọ gaa nʼihu ịlụ ọgụ, tutu anyị edubata ha nʼala nke ha ga-eketa. Ma ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị ga-anọ nʼobodo e wusiri ike, ikpuchite ezinaụlọ anyị niile site nʼaka ndị iro bi anyị gburugburu.
NUM 32:18 Anyị agaghị alọta nʼụlọ anyị tutu onye Izrel ọbụla enweta ihe nketa nke ya.
NUM 32:19 Anyị achọghị ihe nketa, nʼofe Jọdan nke ọzọ, nʼihi na anyị ewerela oke nke anyị nʼebe a, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.”
NUM 32:20 Mgbe ahụ, Mosis zara sị ha, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na unu ga-eme dịka unu kwuru, jikere onwe unu, nʼihu Onyenwe anyị, ibu agha.
NUM 32:21 Ọ bụrụ na ndị agha unu ga-eso gafee nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, soro ndị ọzọ buo agha tutu ruo mgbe Onyenwe anyị chụpụchara ndị iro ya niile,
NUM 32:22 mgbe ahụ, e merichaa mba ndị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị, unu nwere ike ịlọghachi nʼebe a, bụrụ ndị ikpe na-amaghị nʼebe Onyenwe anyị na ndị Izrel nọ. Ala a dị nʼọwụwa anyanwụ, ga-abụ ihe nketa unu nwere site nʼaka Onyenwe anyị.
NUM 32:23 “Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ime dịka unu kwuru, mgbe ahụ, ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-emehie megide. Matakwanụ na unu ga-emesịa nata ụgwọ ọrụ mmehie unu.
NUM 32:24 Wuonụ obodo ebe ndị inyom na ụmụ unu ga-ebi, wuokwanụ ụlọ anụ maka igwe ewu na atụrụ unu, ma mezuokwanụ ihe niile unu kweere na nkwa.”
NUM 32:25 Ndị ebo Gad na Ruben sịrị Mosis, “Anyị bụ ndị ohu gị ga-eme dịka onyenwe anyị nyere nʼiwu.
NUM 32:26 Ụmụ anyị niile, na ndị inyom anyị niile, na igwe ewu na atụrụ anyị, na ehi anyị niile, ga-anọ nʼebe a, nʼobodo ndị a anyị wuru nʼala Gilead.
NUM 32:27 Ma anyị, ndị ohu gị, ndị niile tozuru ije agha, ga-agafe osimiri Jọdan ibu agha nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyenwe anyị si kwuo.”
NUM 32:28 Mgbe ahụ, Mosis nyere Elieza, bụ onye nchụaja, na Joshua nwa Nun, na ndịisi ezinaụlọ nke ebo Izrel niile iwu banyere ha,
NUM 32:29 Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na ndị ebo Gad na Ruben, onye ọbụla nke jikere ịga agha, ga-eso unu gafee Jọdan nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, oge unu lụgburu ndị ala ahụ niile, unu aghaghị inye ha ala Gilead dịka ihe nketa ha.
NUM 32:30 Ma ọ bụrụ na ha ajụ iso unu, ha ga-eso ndị ọzọ keta oke nʼala Kenan.”
NUM 32:31 Ndị ebo Gad na Ruben zara sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka anyị ga-eme.
NUM 32:32 Anyị ga-ejikere soro Onyenwe anyị jee agha nʼala Kenan. Ma ihe nketa anyị ga-adị nʼebe a, nʼakụkụ Jọdan.”
NUM 32:33 Mosis nyere ndị ebo Gad, na Ruben, na ọkara Manase nwa Josef, alaeze niile Saịhọn eze Amọrị nakwa alaeze niile nke Ọg, eze ndị Bashan na-achị. O nyere ha ala ahụ niile, na obodo niile dị nʼala ahụ gburugburu.
NUM 32:34 Ndị ebo Gad wugharịrị ma wusiekwa obodo ndị a, Dibọn, Atarọt, Aroea
NUM 32:35 Atrọt-Shofan, Jeza, Jogbeha,
NUM 32:36 Bet-Nimra na Bet-Haran bụ obodo e wusiri ike, wukwaara igwe ewu na atụrụ ha ụlọ anụ nʼime ya.
NUM 32:37 Ma ndị ebo Ruben wugharịrị obodo ndị a: obodo Heshbọn, Eleale, Kiriatem,
NUM 32:38 Nebo na Baal-Meon (ma a gbanwere aha ha) na Sibma. Ha gbanwere aha obodo niile ndị ahụ ha wugharịrị, gụọ ha aha ọhụrụ.
NUM 32:39 Ndị agbụrụ Makia, nwa Manase gara nʼobodo Gilead lụgbuo ya, chụpụ ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
NUM 32:40 Ya mere, Mosis were obodo Gilead nye Makia, ụmụ Manase ka ha biri nʼebe ahụ.
NUM 32:41 Jia, onye sikwa nʼebo Manase gara buso ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ agha, lụgbuo ha. Ọ gbanwere aha obodo nta ndị a, gụọ ha Havọt Jaịa.
NUM 32:42 Nʼoge a kwa, otu nwoke a na-akpọ Nọba duuru ndị agha gaa nʼobodo Kenat, na nʼobodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, lụgbuo ha, bichie nʼime ha. Ọ gbanwere aha obodo ndị ahụ niile bido ịkpọ ha Nọba, nke bụ aha ya onwe ya.
NUM 33:1 Ndị a bụ usoro mbili ije ụmụ Izrel, site nʼoge ha hapụrụ Ijipt dịka ha si nọọ nʼigwe nʼigwe. Ọ bụ Mosis na Erọn duuru ha nʼije ndị a.
NUM 33:2 Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
NUM 33:3 Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt,
NUM 33:4 mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe.
NUM 33:5 Ndị Izrel hapụrụ Ramesis, bịa maa ụlọ ikwu ha na Sukọt.
NUM 33:6 Ha hapụrụ Sukọt bịaruo Etam, nke dị nʼọnụ ọnụ ọzara ahụ.
NUM 33:7 Ha hapụrụ Etam laghachi azụ gaa Pi Hahirot, nke dị nso nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Baal-Zefọn, ebe ha manyere ụlọ ikwu ha na ndịda ugwu Migdol.
NUM 33:8 Mgbe ha hapụrụ Pi Hahirot, ha sitere nʼetiti Osimiri Uhie gafee gaa ije ụbọchị atọ bata nʼọzara Etam. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mara.
NUM 33:9 Mgbe ha hapụrụ Mara, ha batara Elim, ebe e nwere mmiri iri na abụọ si nʼala na-asọpụta, na iri osisi nkwụ asaa. Ha nọrọ ọdụ dị ukwuu nʼebe a.
NUM 33:10 Mgbe ha hapụrụ Elim, ha wuru ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Osimiri Uhie.
NUM 33:11 Emesịa, ha hapụrụ Osimiri Uhie gaa maa ụlọ ikwu ha nʼọzara a na-akpọ Sin.
NUM 33:12 Ha hapụrụ ọzara Sin gaa maa ụlọ ikwu ha na Dofka.
NUM 33:13 Emesịa, ha hapụrụ Dofka bịaruo Alush maa ụlọ ikwu ha.
NUM 33:14 Mgbe ha hapụrụ Alush, ha rutere Refidim, ebe ndị Izrel na-ahụghị mmiri ọṅụṅụ.
NUM 33:15 Ha hapụrụ Refidim bịaruo nʼọzara Saịnaị ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:16 Ha hapụrụ ọzara Saịnaị bịaruo Kibrọt Hataava ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:17 Ha hapụrụ Kibrọt Hataava bịaruo Hazerọt ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:18 Ha hapụrụ Hazerọt bịaruo Ritma ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:19 Ha hapụrụ Ritma bịaruo Rimon-Perez ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:20 Ha hapụrụ Rimon-Perez bịaruo Libna ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:21 Ha hapụrụ Libna bịaruo Rissa ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:22 Ha hapụrụ Rissa bịaruo Kehelata ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:23 Ha hapụrụ Kehelata bịaruo nʼugwu Shefa ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:24 Ha hapụrụ ugwu Shefa bịaruo Harada ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:25 Ha hapụrụ Harada bịaruo Makhelot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:26 Ha hapụrụ Makhelot bịaruo Tahat ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:27 Ha hapụrụ Tahat bịaruo Tera ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:28 Ha hapụrụ Tera bịaruo Mitka ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:29 Ha hapụrụ Mitka bịaruo Hashmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:30 Ha hapụrụ Hashmona bịaruo Moserot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:31 Ha hapụrụ Moserot bịaruo Bene Jaakan ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:32 Ha hapụrụ Bene Jaakan bịaruo Họ Hagịdgad ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:33 Ha hapụrụ Họ Hagịdgad bịaruo Jotbata ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:34 Ha hapụrụ Jotbata bịaruo Abrona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:35 Ha hapụrụ Abrona bịaruo Eziọn Geba ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:36 Ha hapụrụ Eziọn Geba bịa maa ụlọ ikwu ha na Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.
NUM 33:37 Ha hapụrụ Kadesh bịa maa ụlọ ikwu ha nʼugwu Hor nʼoke ala ndị Edọm.
NUM 33:38 Erọn, bụ onye nchụaja gbagoro nʼugwu Hor site nʼiwu Onyenwe anyị. Nʼebe ọ nọ nwụọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa nke ise, nʼafọ nke iri anọ site na mgbe ụmụ Izrel si Ijipt pụta.
NUM 33:39 Erọn gbara narị afọ na iri afọ abụọ na atọ mgbe ọ nwụrụ nʼugwu Hor.
NUM 33:40 Onye Kenan bụ eze Arad, onye bi na Negev nʼime ala Kenan, nụrụ na ndị Izrel na-abịa.
NUM 33:41 Ha hapụrụ ugwu Hor bịaruo Zalmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:42 Ha hapụrụ Zalmona bịaruo Punon ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:43 Ha hapụrụ Punon bịaruo Obot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:44 Ha hapụrụ Obot bịaruo Iye Abarim, nʼoke ala ndị Moab.
NUM 33:45 Ha hapụrụ Iye Abarim bịaruo Dibọn Gad ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:46 Ha hapụrụ Dibọn Gad bịaruo Almon Diblataim ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:47 Ha hapụrụ Almon Diblataim bịaruo nʼugwu Abarim nke dị nso na Nebo ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:48 Ha hapụrụ ugwu Abarim bata nʼobosara ala Moab nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
NUM 33:49 Mgbe ha nọ nʼebe a, ha manyere ụlọ ikwu ha nʼebe dị iche iche nʼakụkụ osimiri Jọdan, site na Bet-Jeshimọt rute rịị ebe a na-akpọ Ebel-Shitim, nʼobosara ala Moab.
NUM 33:50 Nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ Jọdan, na ncherita ihu Jeriko ka Onyenwe anyị nọ gwa Mosis okwu sị ya,
NUM 33:51 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe unu gafere osimiri Jọdan banye nʼala Kenan,
NUM 33:52 unu aghaghị ịchụpụ ndị niile bi nʼebe ahụ ma bibie chi niile ha na-efe, ndị ha ji nkume tụọ na ndị ha kpụrụ akpụ. Unu ga-ebibikwa ebe niile dị nʼelu ugwu niile, ebe ha na-anọ efe arụsị ha niile ofufe.
NUM 33:53 Nwetanụ ala ahụ, birikwa nʼime ya, nʼihi na enyela m unu ala ahụ ka unu nwere ya.
NUM 33:54 Unu ga-eke ala ahụ site nʼife nza, dịka agbụrụ unu niile si dị. Ndị bara ụba nye ha ihe nketa dị ukwuu, ndị dị ole na ole nye ha ihe nketa dị nta. Ihe ọ bụla ruuru agbụrụ ọbụla site nʼife nza ga-abụ nke ha. Kee ya dịka ebo nna nna unu ha si dị.
NUM 33:55 “ ‘Ma ọ bụrụ na unu achụpụghị ndị niile bi nʼala ahụ, ndị unu hapụrụ ga-abụrụ unu iberibe unyi nʼanya unu. Ha ga-adịkwara unu ka ogwu nke ga-adụkasị unu ahụ. Ha ga-enye unu nsogbu nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya.
NUM 33:56 Mgbe ahụ kwa, aga m emeso unu ụdị mmeso ahụ m na-akwado imeso ha ugbu a.’ ”
NUM 34:1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 34:2 “Nye ndị Izrel iwu sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala Kenan, ndị a bụ oke ala ndị ahụ unu ga-enweta dịka ihe nketa unu:
NUM 34:3 “ ‘Oke ala unu nʼakụkụ ndịda ga-etinyetụ aka nʼọzara Zin. Ala unu na ala ndị Edọm ga-enwekọ oke ala. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ndịda unu ga-ebido na ngwụcha Osimiri Nnu,
NUM 34:4 gafee ndịda Akrabim, gabiga ruo ọzara Zin, gbada ndịda ruo Kadesh Banea. Site nʼebe ahụ ọ ga-aga ruo Haza Ada, gafee ruo Azmọn,
NUM 34:5 ebe ọ ga-echigharị gbasoro iyi Wadi nke Ijipt ma kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.
NUM 34:6 Oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Nke a ga-abụ oke ala unu.
NUM 34:7 Oke ala unu nʼakụkụ ugwu ga-amalite nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼugwu Hor.
NUM 34:8 Ọ ga-esitekwa nʼugwu Hor ruo Lebo Hamat, gbatịakwa ruo Zedad,
NUM 34:9 ruo Zifron tutu kwụsị na Haza Enan. Nke a ga-abụ oke ala unu nʼakụkụ ugwu.
NUM 34:10 Oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebido na Haza Enan ruo Shefam.
NUM 34:11 Oke ala ahụ ga-agbada site Shefam ruo Ribla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Ain. Site nʼebe ahụ, ọ ga-agbasoro ndịda ọdịda anyanwụ Osimiri Galili.
NUM 34:12 Mgbe ahụ, ọ ga-aga ogologo ogologo, gbasoro osimiri Jọdan, tutu kwụsị nʼOsimiri Nnu. “ ‘Nke a bụ ala unu, na oke ala ya nʼakụkụ ọbụla.’ ”
NUM 34:13 Mosis nyere ndị Izrel iwu sị, “Kesaanụ ala a dịka ihe nketa site nʼife nza. Onyenwe anyị enyela iwu ka enye ya ebo itoolu na ọkara ndị ahụ fọdụrụ.
NUM 34:14 Nʼihi na ebo Ruben na Gad tinyere ọkara ebo Manase, enwetalarị ala ihe nketa ha.
NUM 34:15 Ebo abụọ nʼọkara ndị a enwetala ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.”
NUM 34:16 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 34:17 “Ndị a bụ aha ndị ikom m họpụtara ịhụ na e kenyere unu ala ahụ dịka ihe nketa unu. Elieza onye nchụaja, na Joshua nwa Nun.
NUM 34:18 Site nʼebo ọbụla họpụta otu onyendu ka ha nye aka ikesa ala nketa ahụ.
NUM 34:19 “Ndị a bụ aha ndị a họpụtara: “Kaleb nwa Jefune, site nʼebo Juda.
NUM 34:20 Shemuel nwa Amihud, site nʼebo Simiọn
NUM 34:21 Elidad nwa Kislon, site nʼebo Benjamin.
NUM 34:22 Buki nwa Jogli, onyendu si nʼebo Dan.
NUM 34:23 Haniel nwa Efod, onyendu si nʼebo Manase, nwa Josef.
NUM 34:24 Kemuel nwa Shiftan, onyendu si nʼebo Ifrem, nwa Josef.
NUM 34:25 Elizafan nwa Panak, onyendu si nʼebo Zebụlọn.
NUM 34:26 Paltiel nwa Azan, onyendu si nʼebo Isaka.
NUM 34:27 Abihud nwa Shelomi, onyendu si nʼebo Asha.
NUM 34:28 Pedahel nwa Amihud, onyendu si nʼebo Naftalị.”
NUM 34:29 Ndị a bụ ndị ikom Onyenwe anyị nyere iwu si ha kenye ndị Izrel ihe nketa ha nʼala Kenan.
NUM 35:1 Nʼoge a, mgbe ndị Izrel ka nọ nʼakụkụ osimiri Jọdan nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu Jeriko, ka Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 35:2 “Nye ndị Izrel iwu ka ha nye ndị Livayị ụfọdụ obodo ebe ha ga-ebi. Obodo ndị a ga-abụ ndị si nʼihe nketa ndị Izrel ketara. Nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ na-akpa nri, nke ga-agba obodo ndị a gburugburu.
NUM 35:3 Obodo ndị a ga-abụrụ ha ebe obibi, ma ala niile gbara ha gburugburu ga-abụ ebe ịta nri nke igwe ehi na atụrụ, na anụ ụlọ ha niile.
NUM 35:4 “Ala ebe ịta nri nke obodo niile nke unu ga-enye ndị Livayị ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼogologo site na mgbidi obodo ga gburugburu mgbidi obodo ọbụla.
NUM 35:5 Ya mere nʼobodo ndị Livayị ọbụla, ala ịzụ anụ ụlọ ga-adị narị mita anọ na ọkara site na mgbidi ha ruo nʼoke ala ha. Ọ ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ugwu, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ndịda. Obodo ha ga-adịkwa nʼetiti ala ịzụ anụ ụlọ ndị a.
NUM 35:6 “Obodo isii nʼime obodo ndị ahụ unu na-enye ndị Livayị ga-abụ obodo mgbaba, ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama nwere ike gbaga izere ndụ ya. Tinyere obodo ndị a unu ga-enyekwasị ha iri obodo anọ na abụọ ọzọ.
NUM 35:7 Ya mere obodo niile a ga-enye ndị Livayị ga-adị iri obodo anọ na asatọ, tinyere obosara ala ịzụ igwe ewu na atụrụ nke gbara obodo ndị a gburugburu.
NUM 35:8 Obodo unu na-enye ndị Livayị site nʼihe nketa ndị Izrel ga-abụ dịka unu si keta oke unu. A ga-esite nʼaka ebo nwere ọtụtụ obodo wepụta ọtụtụ obodo, ma site nʼaka ebo obodo ha nwere na-ehighị nne wepụta ole na ole.”
NUM 35:9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
NUM 35:10 “Gwa ndị Izrel sị ha, ‘mgbe unu gafere Jọdan banye nʼala Kenan,
NUM 35:11 họpụtanụ ụfọdụ obodo ka ọ bụrụ obodo mgbaba ebe mmadụ nwere ike ịgbabanye ma ọ bụrụ na o gbuo mmadụ na-amaghị ama.
NUM 35:12 Obodo ndị a ga-abụ ebe mgbaba nye onye na-ezere ndụ site nʼaka onye ahụ chọrọ ịbọrọ ọbọ, ka a ghara igbu onye e boro ebubo igbu mmadụ tutu ruo mgbe e buru ụzọ kpee ya ikpe nʼihu ọgbakọ.
NUM 35:13 Obodo isii ndị a unu wepụtara ga-abụ obodo mgbaba.
NUM 35:14 Họpụta obodo mgbaba atọ nʼakụkụ ọzọ nke Jọdan. Ka atọ ndị ọzọ dịrị na Kenan.
NUM 35:15 Obodo ndị a agaghị abụ ebe izere ndụ maka naanị ndị Izrel, kama ọ dịkwara ndị ọbịa na ndị ọzọ bi nʼetiti unu, ka onye na-akpachaghị anya gbuo mmadụ gbaga ebe ahụ izere ndụ ya.
NUM 35:16 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ e jiri mkpirisi igwe tigbuo mmadụ ibe ya, a ga-agụ onye dị otu a dịka ogbu mmadụ. A ga-egbukwa ya.
NUM 35:17 A sịkwa na mmadụ ejide nʼaka ya nkume nke o nwere ike iji tugbuo mmadụ, ọ bụrụ na ọ tụọ mmadụ nkume ahụ tugbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. Ogbu mmadụ ahụ aghakwaghị ịnwụ.
NUM 35:18 A sikwa na mmadụ ji ihe e ji osisi tụọ nʼaka ya, nke o nwere ike i ji tigbuo mmadụ, ọ bụrụ na o tie mmadụ ihe osisi ahụ, tigbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. A ghaghị ime ka ogbu mmadụ ahụ nwụọ.
NUM 35:19 Onye na-abọ ọbọ ọbara ga-egbu ogbu mmadụ ahụ nʼonwe ya mgbe ọbụla o zutere ya.
NUM 35:20 Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼekworo nuo onye ọzọ aka, maọbụ kpachara anya tụọ onye ahụ ihe nke mere ka ọ nwụọ,
NUM 35:21 maọbụ na o sitere nʼobi ọnụma jiri aka ya tie mmadụ ihe nke mere ka ọ nwụọ, a ga-egbu onye ahụ, nʼihi na ogbu mmadụ ka ọ bụ. Onye na-agwachite ọchụ ga-egbu ogbu mmadụ ahụ mgbe ọbụla o zutere ya.
NUM 35:22 “ ‘Ma ọ bụrụ na mmadụ ebughị iro nʼobi nutuo mmadụ ibe ya na mberede, maọbụ tụọ ya ihe,
NUM 35:23 maọbụ tụtuo nkume nke datara dagbuo mmadụ ibe ya mgbe ọ na-ahụghị ya, bụ onye na-abụghị onye iro ya, onye ọ na-ebughị nʼobi imejọ,
NUM 35:24 mgbe ahụ, ndị ọgbakọ ga-ekpe ikpe nʼetiti onye e boro ebubo na onye na-agwachite ọchụ dịka usoro iwu ndị a si dị.
NUM 35:25 Nzukọ aghaghị ichekwa onye e boro ebubo na o gburu mmadụ site nʼaka onye na-agwachite ọchụ, zilaga onye ahụ e boro ebubo nʼobodo mgbaba, bụ ebe ha gbalagara. Onye ahụ e boro ebubo ga-anọgide nʼobodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ, bụ onye ahụ e tere mmanụ nsọ.
NUM 35:26 “ ‘Ma ọ bụrụ na ogbu mmadụ a ahapụ obodo mgbaba ahụ pụọ, ọ bụrụkwa,
NUM 35:27 na onye ahụ na-abọ ọbọ ọbara achọta ya nʼazụ obodo mgbaba ahụ, o nwere ike igbu onye ahụ e boro ebubo, ikpe igbu mmadụ agaghị ama ya.
NUM 35:28 Onye ahụ e boro ebubo na o gburu mmadụ aghaghị ịnọ nʼime obodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ. Ọ bụ naanị mgbe onyeisi nchụaja nwụchara, ka ha nwere ike ịlaghachi nʼụlọ ya, nʼihe nketa ya.
NUM 35:29 “ ‘Ndị a bụ usoro iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ, nʼebe obibi unu niile.
NUM 35:30 “ ‘Onye ọbụla gburu mmadụ ga-anwụ. A ga-ama ya ikpe ọnwụ naanị mgbe e nwere karịa otu onye akaebe. Ọ dịghị onye ọbụla a ga-egbu nʼihi akaebe nke otu onye gbara megide ya.
NUM 35:31 “ ‘Unu a narakwala ihe ịgbara isi nʼọnọdụ ndụ nke onye gburu mmadụ, bụ onye nke ikpe ọnwụ mara. Aghaghị ime ka ha nwụọ.
NUM 35:32 “ ‘Unu a narakwala ihe mgbapụta site nʼaka onye ọbụla nke gbagara nʼobodo mgbaba, site otu a kwere ka ha lọghachite azụ ga biri nʼala nke aka ha tupu onyeisi nchụaja anwụọ.
NUM 35:33 “ ‘Unu emerụkwala ala ahụ nke unu bi nʼime ya. Ọbara igbu ọchụ na-emerụ ala. Ọ dịkwaghị mkpuchi mmehie a ga-eme banyere ala a wufuru ọbara nʼime ya, ma ọ bụghị naanị ọbara nke onye ahụ gburu ọchụ ahụ.
NUM 35:34 Unu emerụla ala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya. Nʼihi na mụ onwe m bikwa nʼebe ahụ, mụ bụ Onyenwe anyị bi nʼetiti ụmụ Izrel.’ ”
NUM 36:1 Nʼoge ahụ, ndịisi ezi agbụrụ Gilead, nwa Makia, nwa Manase, otu nʼime ụmụ Josef, bịakwutere Mosis na ndị ndu, na ndịisi ezi ụmụ Izrel sị ha:
NUM 36:2 “Mgbe Onyenwe anyị nyere unu onyenwe m iwu inye ụmụ Izrel ala ahụ nʼihe nketa site nʼife nza, onye nyekwara gị iwu iwere ihe nketa nwanne anyị nwoke Zelofehad nyefee nʼaka ụmụ ya ndị inyom.
NUM 36:3 Ugbu a, ọ bụrụ na ha alụọ ndị ikom Izrel si nʼebo ọzọ, mgbe ahụ, ihe nketa ha ga-abụ nke anapụrụ anyị, tụkwasị nʼihe nketa nke ebo ebe ha lụrụ di. Nʼụzọ dị otu a, ihe nketa anyị ga-abụ nke e wepụrụ ihe site na ya.
NUM 36:4 Mgbe afọ inwere onwe nye Izrel ruru, a ga-agụnye ihe nketa ha nʼebo ebe ha lụrụ dị. A ga-esi otu a wepụ ala ha site nʼihe nketa nke nna nna anyị ha ketara.”
NUM 36:5 Mgbe ahụ, Mosis nyere ndị Izrel ntụziaka site nʼiwu Onyenwe anyị sị, “Ihe ndị ikom ebo Josef na-ekwu ziri ezi.
NUM 36:6 Ma nke a bụ iwu Onyenwe anyị na-enye maka ụmụ ndị inyom Zelofehad. Ha nwere ike ịlụ onye ọbụla masịrị ha, ma onye ha ga-alụ ga-abụrịrị onye si nʼagbụrụ ebo nna ha.
NUM 36:7 O nweghị ihe nketa ọbụla nʼIzrel ga-esi nʼaka otu ebo gafee nʼebo ọzọ. Nʼihi na ihe nketa nke ebo ọbụla ga-adịgidere ha dịka otu e siri kee ya nye nna nna ha.
NUM 36:8 Nwa nwanyị Izrel ọbụla ketara ala nʼebo Izrel ọ bụla ga-alụ di site nʼagbụrụ ebo nna ya. Ka ala ha ghara ịgafere ebo ọzọ.
NUM 36:9 Ọ dịghị ihe nketa ọbụla ga-esi nʼotu ebo feere ebo ọzọ. Nʼihi na ebo Izrel ọbụla ga-edebere onwe ha ala ha ketara.”
NUM 36:10 Ya mere, ụmụ ndị inyom Zelofehad mere dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
NUM 36:11 Ụmụ Zelofehad ndị a: Mahla, na Tịaza, na Hogla, na Milka, na Noa, lụrụ ndị ikom si nʼebo nna ha.
NUM 36:12 Ha lụrụ di nʼagbụrụ ụmụ Manase, nwa Josef. Nʼụzọ dị otu a, ihe nketa ha dịgidere nʼebo na agbụrụ nna ha.
NUM 36:13 Ndị a bụ iwu na ụkpụrụ Onyenwe anyị sitere nʼaka Mosis nye ndị Izrel nʼoge ha nọ nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko.
DEU 1:1 Ndị a bụ okwu ahụ Mosis gwara Izrel niile mgbe ha nọ nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼọzara nʼAraba, ebe chere ihu nʼobodo Suf, nʼetiti Paran na Tofel na Leban, na Hazerọt, na Dizahab.
DEU 1:2 Site nʼugwu Horeb ruo Kadesh Banea, bụ njem abalị iri na otu ma e soro ụzọ gawara ugwu Sia.
DEU 1:3 Ọ bụ nʼabalị mbụ nke ọnwa iri na otu, nke afọ iri anọ ka Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu banyere ha.
DEU 1:4 Nke mere mgbe ọ lụgbuchara Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, lụgbukwaa Ọg, eze ndị Bashan na Edrei, onye na-achị nʼAshtarọt.
DEU 1:5 Nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala ndị Moab ka Mosis nọ kọwaara ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha,
DEU 1:6 Onyenwe anyị Chineke anyị gwara anyị nʼugwu Horeb sị, “Unu anọọla ọtụtụ oge nʼugwu a.
DEU 1:7 Ugbu a bilienụ ije, baa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Gaakwanụ nʼala niile ndị agbataobi ha bụ Araba, nʼugwu niile na nʼebe dị ala ala na Negeb, nʼọnụ mmiri nke oke osimiri, garuokwanụ ala ndị Kenan na nke ndị Lebanọn, gagidekwanụ ruo nʼosimiri ukwu Yufretis.
DEU 1:8 Lee, enyela m unu ala ahụ niile! Baanụ nʼime ya, bichiekwanụ ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu bụ Ebraham, Aịzik, Jekọb na ụmụ ụmụ ha niile ndị ga-esote ha.”
DEU 1:9 Nʼoge ahụ, agwara m unu ụmụ Izrel okwu sị, “Unu bụụrụ m oke ibu arọ, apụghịkwa m ibu unu naanị m.
DEU 1:10 Onyenwe anyị Chineke unu emeela ka unu mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe.
DEU 1:11 Ka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha meekwa ka unu mụbaa nʼọnụọgụgụ, puku kwụrụ puku, ya gọziekwa unu dịka o kwere na nkwa.
DEU 1:12 Ma olee otu naanị m ga-esi buo ibu unu, doziekwa ise okwu unu na nsogbu unu niile?
DEU 1:13 Họpụtanụ ụfọdụ ndị ikom nwe amamihe, nghọta, na ndị a na-akwanyere ụgwụ, site nʼebo niile unu nʼotu nʼotu, aga m emekwa ha ndịisi unu.”
DEU 1:14 Unu zara sị m, “Ihe ahụ i zubere ime dị mma.”
DEU 1:15 Ya mere, a kpọọrọ m ndịisi nʼebo dị iche iche, ndị ikom maara ihe, na ndị a na-asọpụrụ, mee ka ha bụrụ ndịisi ọchịchị unu, ụfọdụ ha na-elekọta puku mmadụ, ụfọdụ narị mmadụ, ndị ọzọ na-elekọta iri mmadụ ise, ndị ọzọ mmadụ iri, ka ha bụrụ ndị ndu ebo dị iche iche.
DEU 1:16 Adọrọ m ndị ikpe unu a aka na ntị nʼoge ahụ sị ha, “Nụrụnụ ikpe niile metụtara esemokwu dị nʼetiti ụmụnna unu, ma kpeenụ ikpe ọbụla na-eleghị mmadụ anya nʼihu ma ikpe ahụ ọ dị nʼetiti ụmụnna unu ndị Izrel, maọbụ nʼetiti ndị Izrel na ndị ọbịa.
DEU 1:17 Kpeenụ ikpe ziri ezi nye onye ukwu na onye nta. Elekwala ndị unu na-ekpe ikpe anya nʼihu, nʼihi na unu na-ekpe ikpe unu nʼọnọdụ Chineke.” Enyekwara m ha iwu sị ha wetaranụ m ikpe niile siri unu ike ka m leba ha anya.
DEU 1:18 Nʼoge ahụ, agwara m unu ihe niile unu na-aghaghị ime.
DEU 1:19 Emesịa, dịka iwu Onyenwe anyị Chineke anyị nyere si dị, anyị hapụrụ ugwu Horeb, chee ihu gawa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Ụzọ anyị si gafee ọzara ukwu ahụ dị egwu nke unu ji anya unu hụ tutu anyị erute Kadesh Banea.
DEU 1:20 Mgbe ahụ agwara m unu okwu sị, “Unu erutela nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait, ala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.
DEU 1:21 Lee, Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala ahụ. Gaanụ nweta ya ka ọ bụrụ nke unu dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu gwara unu sị, Unu atụla egwu, ka obi unu gharakwa ịda mba.”
DEU 1:22 Ma unu niile bịakwutere m sị m, “Ka anyị zipụ ndị nnyocha ka ha gaa mata ezi ụzọ e si abanye nʼala ahụ. Anyị ga-ekpebikwa obodo ndị anyị ga-ebu ụzọ banye.”
DEU 1:23 Ntụpụta unu juru m afọ, nʼihi ya, esitere m nʼetiti unu họpụta mmadụ iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla.
DEU 1:24 Ndị a pụrụ, gbagoo ala ugwu ugwu ahụ tutu bịaruo na Ndagwurugwu Eshkọl. Ha legharịrị anya nʼala ahụ.
DEU 1:25 Ha ghọtara ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi mịrị nʼala ahụ, bulatara anyị. Ha wetakwaara anyị ozi, sị, “Ala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-aga inye anyị dị mma.”
DEU 1:26 Ma unu jụrụ ịga nʼala ahụ, si otu a nupu isi megide iwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere.
DEU 1:27 Unu nọ nʼụlọ ikwu unu tamuo ntamu na-asị, “Nʼezie Onyenwe anyị ahụghị anyị nʼanya. Lee ka o si site nʼala Ijipt dupụta anyị were anyị nyefee nʼaka ndị Amọrait ka ha laa anyị nʼiyi!
DEU 1:28 Ebee ka anyị nwere ike ịga ugbu a? Ụmụnna anyị gara nyochaa ala ahụ emenyela anyị egwu. Ha sịrị, ‘Na ndị bi nʼala ahụ toro ogologo karịa anyị bụrụkwa ndị dị ike. Ha sịkwara na mgbidi e ji gbaa obodo ha gburugburu topuru ruo nʼeluigwe! Anyị hụkwara ụmụ Anak nʼebe ahụ.’ ”
DEU 1:29 Ma agwara m unu sị, “Ka ụjọ ghara ịtụ unu, unu atụla ndị ahụ egwu.
DEU 1:30 Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-aga nʼihu unu, ga-alụrụ unu ọgụ, dịka o si lụọra unu ọgụ nʼihu anya unu, nʼala Ijipt,
DEU 1:31 nakwa nʼime ọzara, ebe unu nọ hụ otu Onyenwe anyị Chineke unu si bulie unu elu dịka nna si ebuli nwa ya elu, nʼụzọ niile unu gbasoro tutu unu erute ebe a.”
DEU 1:32 Ma agbanyeghị nke a, unu ekwenyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu,
DEU 1:33 bụ onye gara nʼihu unu nʼije unu niile, ịchọpụtara unu ebe unu ga-ama ụlọ ikwu unu, onye jikwa ọkụ duo unu nʼabalị, jiri igwe ojii duo unu nʼehihie, iji zi unu ụzọ unu ga-agbaso.
DEU 1:34 Ma otu o si dị, mgbe Onyenwe anyị nụrụ ntamu unu, iwe dị ukwuu were ya, nʼihi ntamu unu, ọ ṅụrụ iyi sị,
DEU 1:35 “O nweghị otu onye nʼime ọgbọ ọjọọ a ga-anọ ndụ hụ ala ọma ahụ m ṅụrụ iyi inye nna nna unu,
DEU 1:36 karịakwa Kaleb, nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ala ahụ anya, aga m enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ọ zọkwasịrị ụkwụ ya, nʼihi na o ji obi ya niile sogide Onyenwe anyị.”
DEU 1:37 Ọ bụkwa nʼihi unu ka Onyenwe anyị ji weso m iwe, na-asị, “Gị onwe gị kwa, ị gaghị aba nʼebe ahụ!
DEU 1:38 Kama Joshua, nwa Nun, onye na-enyere gị aka, ga-edu ha banye nʼebe ahụ. Gbaa ya ume nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị Izrel inweta ala ahụ dịka ihe nketa ha.
DEU 1:39 Ọ bụkwa ụmụntakịrị ahụ na-amaghị ihe dị iche site nʼihe ọma na ihe ọjọọ ka m ga-enye ala ahụ. Ha ga-abanye nʼime ya, nweta ya dịka ihe nketa.
DEU 1:40 Ma unu onwe unu, bilienụ, chigharịa gawa nʼime ọzara. Cheenụ ihu unu nʼOsimiri Uhie.”
DEU 1:41 Mgbe ahụ, unu kwupụtara mmehie unu sị, “Anyị emehiela megide Onyenwe anyị. Anyị ga-agbago nʼala ahụ gaa lụọ ọgụ, dịka Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị nʼiwu.” Ya mere, onye ọbụla nʼime unu yikwasịrị ihe agha ya na-eche na ọ dị mfe ịgbago nʼobodo ndị ahụ dị nʼugwu.
DEU 1:42 Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gwa ha, ‘Unu arịgokwala, gaa buo agha, nʼihi na agaghị m anọnyere unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu.’ ”
DEU 1:43 Ya mere, agwara m unu, ma unu aṅaghị ntị. Unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jiri nganga juru unu obi bilie, rigoo nʼobodo ahụ dị nʼugwu.
DEU 1:44 Ndị Amọrị bụ ndị bi nʼugwu ahụ pụtara, ha chụsasịrị unu dịka aṅụ si eme, tidaa unu nʼala site na Sia ruo Homa.
DEU 1:45 Emesịa, unu lọghachiri bịa kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị, ma o geghị ntị nye olu akwa unu, ọ ṅakwaghị unu ntị.
DEU 1:46 Nʼihi ya, unu nọrọ ọtụtụ oge na Kadesh.
DEU 2:1 Anyị laghachiri azụ chee ihu nʼọzara nʼụzọ gawara Osimiri Uhie, dịka Onyenwe anyị gwara m. Ọtụtụ afọ ka anyị nọ na-awagharị gburugburu ugwu Sia.
DEU 2:2 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m,
DEU 2:3 “Unu agbaala ala ugwu ugwu a gburugburu ogologo oge, cheenụ ihu nʼakụkụ ugwu.
DEU 2:4 Nye ụmụ Izrel iwu ndị a: ‘Unu ga-aga site nʼala ụmụnna unu ndị Edọm gafee. Ndị Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, onye biri na Sia. Ha ga-atụ egwu mgbe ha nụrụ na unu ga-esi nʼala ha gafee, ma kpachapụnụ anya.
DEU 2:5 Unu akpasukwala ha ka ha lụsoo unu ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ọbụla sitere nʼala ha, ọ bụladị ebe ga-ezuru unu ịzọkwasị ụkwụ unu. Enyela m Ịsọ ala niile nke ugwu Sia dịka nke aka ya.
DEU 2:6 Jirinụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nri ọbụla unu riri, jirikwanụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nʼihi mmiri ọbụla unu ṅụrụ.’ ”
DEU 2:7 Onyenwe anyị Chineke unu agọziela unu nʼihe ọbụla bụ akaọrụ unu. O cheela nzọ ụkwụ unu nche iri afọ anọ ndị a niile unu wagharịrị nʼọzara ukwuu a. Onyenwe anyị Chineke unu anọnyerela unu, ọ dịkwaghị ihe kọrọ unu.
DEU 2:8 Ya mere, anyị sitere nʼala ụmụnna anyị bụ ụmụ Ịsọ, ndị bi na Sia gafee. Anyị hapụkwara ụzọ Araba nke si Elat na Eziọn Geba, tụgharịa gawa elu elu ụzọ ọzara Moab.
DEU 2:9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị dọrọ anyị aka na ntị sị, “Unu esogbula maọbụ lụso ndị Moab ọgụ nʼihi na unu enweghị oke nʼala ha, nʼihi na enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala Ar ka ọ bụrụ ihe nketa nke ha.”
DEU 2:10 (Ndị biri nʼebe ahụ na mgbe gara aga bụ ndị Emim, agbụrụ ha gbara dimkpa dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ. Ha toro ogologo dịka ndị Anak.
DEU 2:11 A na-eche na ha bụ ndị Refaim, dịka ndị Anak, ma ndị Moab na-akpọ ha ndị Emim.
DEU 2:12 Ma mgbe gara aga ọ bụ ndị Hor bi na Sia, ma ndị Edọm, ụmụ Ịsọ, chụpụrụ ha. Ha bibiri ndị Hor bichikwaa ala ha, dịka ụmụ Izrel si bichie nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha dịka ihe nketa.)
DEU 2:13 Onyenwe anyị gwara anyị okwu sị, “Ugbu a bilienụ, gafee Ndagwurugwu Zered.” Anyị bilikwara gafee.
DEU 2:14 Iri afọ atọ na asatọ gasịrị, site na mgbe anyị hapụrụ Kadesh Banea ruo mgbe anyị gafere Ndagwurugwu Zered! Nʼoge a, ọgbọ ndị ikom ahụ niile na-alụ agha anwụchaala site nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị ṅụrụ ha nʼiyi.
DEU 2:15 E, aka Onyenwe anyị dị megide ha, ruo mgbe o mere ka ha niile nwụchaa site nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ.
DEU 2:16 Mgbe onye nke ikpeazụ nʼime ndị niile a tozuru ije agha nwụchara,
DEU 2:17 Onyenwe anyị sịrị m,
DEU 2:18 “Taa, ụmụ Izrel ga-esi na Ar gafee oke ala ndị Moab.
DEU 2:19 Mgbe unu bara nʼala ndị Amọn, unu esogbula ha, unu alụsola ha ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ndị Amọn. Enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala ahụ dịka ihe onwunwe ha.”
DEU 2:20 Ndị bi nʼebe a na mbụ bụ ndị Refaim, ma ụmụ Amọn na-akpọ ha ndị Zamzum.
DEU 2:21 Ha bụ agbụrụ dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, siekwa ike nke ukwuu, ha toro ogologo dịka ụmụ Anak. Onyenwe anyị sitere nʼaka ndị Amọn laa ha nʼiyi, bụ ndị chụpụrụ ha ma bichie nʼobodo ha.
DEU 2:22 Onyenwe anyị mekwara otu ihe ahụ nye ndị agbụrụ Ịsọ bụ ndị bi nʼugwu Sia mgbe ọ lara ndị Hor bụ ụzọ biri nʼebe ahụ nʼiyi. Ha chụpụrụ ha, bichie ala ha ruo taa.
DEU 2:23 Ebe ọzọkwa Onyenwe anyị mere ihe dị otu a bụ mgbe o mere ka ndị Kafto laa ndị Avim nʼiyi. Ha bichiri obodo nta niile ndị Avim nwere nke dị gburugburu ebe ahụ rukwaa Gaza.
DEU 2:24 Emesịa, Onyenwe anyị sịrị, “Gafeenụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, baakwanụ nʼalaeze Saịhọn, onye Amọrị, eze obodo Heshbọn. Lụsonụ ya agha, bichiekwanụ nʼala ya nʼihi na enyefeela m ya bụ eze na ala ya nʼaka unu.
DEU 2:25 Site taa gaa nʼihu, aga m etinye egwu na ụjọ nʼobi ndị niile bi nʼokpuru mbara eluigwe. Ha ga-anụ akụkọ unu tụọ oke egwu, maakwa jijiji nʼihi unu.”
DEU 2:26 Esitere m nʼọzara Kedemot zipụ ndị ozi, ka ha jekwuru Saịhọn, eze Heshbọn, zie ya ozi na anyị chọrọ udo, sị,
DEU 2:27 “Kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-anọ. Anyị agaghị atụgharị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.
DEU 2:28 Renye anyị ihe oriri anyị ga-eri na mmiri anyị ga-aṅụ nʼọnụ ahịa ọlaọcha. Naanị kweere ka anyị gabiga nʼụkwụ ala,
DEU 2:29 dịka ụmụ Ịsọ, bụ ndị bi na Sia, nakwa ndị Moab bi nʼobodo Ar meere anyị, ruo mgbe anyị gafere Jọdan banye nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.”
DEU 2:30 Ma Saịhọn, eze Heshbọn, ekweghị ka anyị si nʼala ya gafee. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu mere ka mmụọ ya sie ike, meekwa ka o mesie obi ya ike, ka o si otu a nyefee ya nʼaka unu dịka ọ mere ugbu a.
DEU 2:31 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Lee, amalitela m iwere Saịhọn na obodo a nyefee unu nʼaka. Ngwanụ, malitenụ ibuso ya agha! Merienụ ya, nwetakwanụ ala ya.”
DEU 2:32 Mgbe Saịhọn na ndị agha ya niile pụtara izute anyị nʼagha nʼebe a na-akpọ Jehaz,
DEU 2:33 Onyenwe anyị Chineke anyị nyefere ya nʼaka anyị. Anyị gburu ya, gbukwaa ụmụ ya ndị ikom niile, na ndị agha ya niile.
DEU 2:34 Nʼoge ahụ, anyị meriri obodo ya niile, bibiekwa ha niile kpamkpam, ma ndị ikom, ma ndị inyom, ma ụmụntakịrị. Anyị ahapụghị mmadụ onye ndụ.
DEU 2:35 Ma ihe ndị anyị bukọọrọ bụ naanị anụ ụlọ, na ngwongwo ndị ọzọ dị iche iche anyị si nʼobodo ndị anyị meriri kwata.
DEU 2:36 Anyị lụgburu ndị niile bi nʼobodo dị site nʼAroea ruo nʼọnụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, na site nʼetiti ndagwurugwu ahụ ruo Gilead. O nweghị obodo ọbụla rara anyị ahụ imeri, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke nyefere ha niile nʼaka anyị.
DEU 2:37 Ma dịka usoro iwu Onyenwe anyị Chineke anyị si dị, anyị abanyeghị ala ndị Amọn ọbụla maọbụ ruokwa nʼala dị nʼakụkụ iyi Jabọk nso, maọbụ nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼugwu.
DEU 3:1 Ihe ọzọ bụ na anyị chigharịrị, gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, ya na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụta izute anyị nʼagha na Edrei.
DEU 3:2 Ma Onyenwe anyị gwara m okwu, sị, “Atụla ya egwu, nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait, onyeisi obodo Heshbọn.”
DEU 3:3 Ya mere, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nyefere Ọg, eze Bashan na ndị agha ya niile nʼaka anyị. Anyị gbuchapụkwara ha niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ.
DEU 3:4 Nʼoge ahụ, anyị lụgburu obodo ya. Ọ dịghị obodo ọbụla nʼime iri obodo isii ahụ niile nke anyị na-anaraghị ha, ya bụ akụkụ Agob niile bụ alaeze Ọg nʼime Bashan.
DEU 3:5 Obodo ndị a bụ obodo e wusiri ike, nwechara mgbidi dị elu nke ukwuu, nwekwaa ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha. Anyị lụgbukwara ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ, ndị na-enweghị mgbidi.
DEU 3:6 Anyị bibiri ihe niile dị nʼobodo Bashan, dịka anyị mere nʼobodo Saịhọn, eze Heshbọn. Anyị gburu mmadụ niile bi nʼime ha, nwoke, nwanyị, na ụmụntakịrị.
DEU 3:7 Ma anụ ụlọ ha niile, na ihe nkwata si nʼobodo ha niile, bụ ihe anyị lụtara nʼagha nye onwe anyị.
DEU 3:8 Mgbe ahụ, anyị napụrụ ala ahụ site nʼaka eze abụọ ndị Amọrait, ya bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha dị site na ndagwurugwu Anọn ruo nʼugwu Hemon.
DEU 3:9 (Aha ndị Saịdọn na-akpọ ugwu Hemon bụ Siriọn, ma ndị Amọrait na-akpọ ya Senia.)
DEU 3:10 Anyị meriri obodo ndị ahụ niile dị nʼala dị larịị, meriekwa Gilead niile na Bashan, tutu ruo obodo Saleka na Edrei, obodo ndị dị nʼalaeze Ọg, eze Bashan.
DEU 3:11 (Ọg, eze ndị Bashan bụ naanị onye fọdụrụ ndụ nʼagbụrụ ndị Refaim. E ji igwe kwaa ihe ndina ya, nke ogologo ya dị mita anọ, nke obosara ya bụkwa mita abụọ. Ihe ndina a dị ruo taa nʼobodo Raba, otu nʼime obodo ndị Amọn.)
DEU 3:12 Mgbe anyị nwetara ala ndị a, eweere m ya nye ndị Ruben, na Gad, ya bụ, oke ala dị nʼebe obodo ugwu Aroea, nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn. Tinyekwara ọkara obodo ugwu Gilead, na obodo niile dị nʼime ya.
DEU 3:13 Ala fọdụrụ na Gilead nakwa Bashan niile na alaeze Ọg ka m nyere otu ọkara ebo Manase. Nke a bụ ala Agob niile dị na Bashan, bụ ndị amaara dịka ala ndị Refaim.
DEU 3:14 Jaịa, onye si nʼebo Manase, were ala niile dị nʼAgob, ọ bụladị ruo nʼoke ala ndị Geshua na ndị Maaka. Ọ kpọrọ ya nʼaha ya, nke mere na ruo taa ihe a na-akpọ Bashan bụ Havọt Jaịa, nke pụtara, obodo Jaịa.
DEU 3:15 Makia ka m nyere Gilead.
DEU 3:16 Ma Ebo Ruben na Gad ka m nyere ala niile dị site na Gilead ruo nʼetiti ndagwurugwu Anọn, na site na ndagwurugwu a ruo nʼiyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Etiti ndagwurugwu Anọn bụkwa oke ala ebo Ruben na Gad.
DEU 3:17 Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ osimiri Jọdan nke dị nʼAraba. Oke ala a sitere na Kineret gbatịa ruo nʼOsimiri Araba (ya bụ Osimiri Nnu), nke dị na mgbada ugwu Pisga.
DEU 3:18 Enyekwara m unu iwu nʼoge ahụ sị, “Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala a ka unu nwere ya. Ma ndị unu niile, ndị bụ dimkpa, ndị jikeere maka agha, ga-agafe nọrọ ndị Izrel ndị ọzọ nʼihu.
DEU 3:19 Otu ọ dị, ebe ọ bụ na unu nwere ọtụtụ anụ ụlọ, ndị nwunye unu na ụmụntakịrị unu ga-ebi nʼobodo ndị m nyere unu, lekọtaa anụ ụlọ unu anya,
DEU 3:20 tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-enye ụmụnna unu mmeri dịka o nyere unu. Mgbe ha nwetara ala Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye ha nʼofe Jọdan, onye ọbụla nʼime unu nwere ike lọghachi bịa biri nʼala unu.”
DEU 3:21 Nʼoge ahụ, agwara m Joshua okwu sị, “I jirila anya gị hụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị mere eze abụọ ndị a. Otu a ka ọ ga-emekwa alaeze niile dị nʼofe Jọdan ebe unu na-aga.
DEU 3:22 Atụla ha egwu, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị ga-alụrụ gị ọgụ.”
DEU 3:23 Nʼoge ahụ, arịrịọ m Onyenwe anyị arịrịọ sị ya,
DEU 3:24 “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị malitela igosi mụ bụ ohu gị ịdị ukwuu gị na ike gị. O nweghị chi ọzọ dị nʼeluigwe maọbụ nʼụwa pụrụ ịrụ ọrụ ebube niile ị rụrụ.
DEU 3:25 Kwere ka m gafee hụ ala ọma ahụ dị nʼofe ọzọ nke Jọdan, ala ugwu ugwu ahụ mara mma, na Lebanọn.”
DEU 3:26 Ma nʼihi unu, Onyenwe anyị wesoro m iwe jụ ige m ntị! Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “O zuola! Agwakwala m ihe ọbụla banyere okwu a.
DEU 3:27 Gaa, rigoruo nʼelu ugwu Pisga, site nʼebe ahụ lepụ anya nʼakụkụ ugwu na ndịda ma nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. Ọ bụ anya gị ka ị ga-eji hụ ala ahụ, nʼihi na ị gaghị agafe osimiri Jọdan.
DEU 3:28 Nye Joshua ike ka ọ nọchie ọnọdụ gị. Gbaakwa ya ume, nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị a gafee Jọdan iketa ala ahụ niile ị ga-ahụ.”
DEU 3:29 Ya mere, anyị nọdụrụ na ndagwurugwu ahụ dị nso na Bet-Peoa.
DEU 4:1 Ugbu a, O Izrel, gee ntị nʼụkpụrụ na iwu niile m na-aga ikuziri unu ka unu na-eme ma ọ bụrụ na unu chọrọ ịdị ndụ banye, ma nwetakwa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha na-enye unu.
DEU 4:2 Unu atụkwasịla iwu ọzọ nʼelu iwu ndị a, ma ọ bụkwanụ site na ha wepụ iwu ọbụla. Kama, meenụ ihe iwu ndị a na-ekwu, nʼihi na ha si nʼaka Onyenwe anyị Chineke unu.
DEU 4:3 Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere na Baal-Peoa. Onyenwe anyị Chineke unu sitere nʼetiti unu bibie ndị niile gbasoro Baal nke Peoa.
DEU 4:4 Ma unu niile nọgidesịrị ike soro Onyenwe anyị Chineke unu bụ ndị dị ndụ taa.
DEU 4:5 Lee, ezila m unu ụkpụrụ na iwu niile Onyenwe anyị Chineke m sị m zi unu, iwu unu na-aghaghị idebe nʼala ahụ unu na-aga inweta.
DEU 4:6 Lezienụ anya hụ na unu debere ha, nʼihi na nke a ga-egosi mba gbara unu gburugburu na unu bụ ndị nwere nghọta na amamihe. Nʼihi na mgbe ha nụrụ banyere ụkpụrụ ndị a, ha ga-ekwu okwu sị, “Nʼezie, ndị jupụtara na mba ukwu a bụ ndị nwere nghọta na amamihe.”
DEU 4:7 Olee mba ọzọ dị ukwuu, nke e mere ka chi ha nọọ ha nso dịka Onyenwe anyị Chineke anyị si na-anọ anyị nso mgbe ọbụla anyị kpọkuru ya nʼekpere?
DEU 4:8 Olee mba ukwu ọzọ dịkwa nke nwere ụkpụrụ na iwu ziri ezi dịka iwu ndị a m na-enye unu taa?
DEU 4:9 Naanị kpachapụnụ anya unu, ma cheenụ onwe unu nche mgbe niile, ka unu ghara ichefu ihe ndị a niile unu ji anya unu hụ, ka ha gharakwa isi nʼobi unu pụọ ụbọchị niile nke ndụ unu. Kama kuziere ha ụmụ unu, na ụmụ ụmụ ndị ga-esote ha.
DEU 4:10 Cheta ụbọchị ahụ unu bịara guzo nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu nʼugwu Horeb, nʼụbọchị ahụ ọ gwara m okwu sị m, “Kpọkọtaa ụmụ Izrel ka ha bịa nʼihu m, nụrụ okwu m, ka ha nwee ike mụta ịtụ m egwu ụbọchị niile nke ha ga-ebi nʼala ahụ, ka ha nweekwa ike ikuziri ụmụ ha.”
DEU 4:11 Ọ bụ nʼala ugwu ahụ ka unu bịara nso, guzo, mgbe ọkụ si nʼugwu ahụ na-ere, na-alali elu iru eluigwe, ya na igwe ojii nakwa oke ọchịchịrị.
DEU 4:12 Mgbe ahụ Onyenwe anyị sitere nʼọkụ ahụ gwa unu okwu. Unu nụrụ ụda olu ya, ma unu ahụghị oyiyi ọbụla anya, naanị ụda olu.
DEU 4:13 O nyere unu ọgbụgba ndụ ya, nke unu na-aghaghị idebe. Ha dị iwu iri. O dere ha na mbadamba nkume abụọ.
DEU 4:14 E, ọ bụ nʼoge ahụ ka Onyenwe anyị nyere m iwu sị m nye unu ụkpụrụ na iwu unu ga-agbaso mgbe unu banyere nʼala ahụ dị nʼofe Jọdan, nke unu na-aga inweta.
DEU 4:15 Unu maara na unu ahụghị ụdịdị Onyenwe anyị anya nʼụbọchị ahụ o sitere nʼọkụ gwa unu okwu nʼugwu Horeb. Ya mere kpachapụrụnụ onwe unu anya
DEU 4:16 ka unu ghara imerụ onwe unu site nʼịkpụ oyiyi ọbụla dịka arụsị, ụdị oyiyi ihe ọbụla, maọbụ nʼụdị nwoke maọbụ nʼụdị nwanyị,
DEU 4:17 maọbụ nʼụdị anụmanụ, maọbụ nʼụdị nnụnụ na-efe efe,
DEU 4:18 maọbụ nʼụdị anụ na-akpụ akpụ, ma ọ bụkwanụ nʼụdị azụ bi na mmiri.
DEU 4:19 Mgbe unu lere anya na mbara eluigwe hụ anyanwụ, ọnwa, na kpakpando, dịka ha si basaa na mbara eluigwe, unu ekwela ka unu bụrụ ndị a na-arafu ịkpọ isiala nye ha na ife ha ofufe bụ ihe ndị a Onyenwe anyị Chineke unu kere nye mba niile bi nʼokpuru eluigwe.
DEU 4:20 Ma banyere unu, Onyenwe anyị kpọọrọ unu, kpọpụta unu site nʼime ọkụ na-agbaze igwe, site nʼIjipt pụta, ka unu bụrụ ihe nketa ya, dịka unu dị ugbu a.
DEU 4:21 Onyenwe anyị wesoro m iwe nʼihi unu, ọ ṅụrụ iyi na m agaghị agafe osimiri Jọdan ịbanye nʼala ọma ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa gị.
DEU 4:22 Aghaghị m ịnwụ nʼala a. Agaghị m agafe Jọdan. Ma unu ga-agafe gaa nweta ala ọma ahụ.
DEU 4:23 Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ unu na Onyenwe anyị Chineke unu nwekọrọ, unu emerela onwe unu arụsị yiri ụdịdị ihe ọbụla, ndị ahụ iwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere megidere.
DEU 4:24 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ bụ Chineke ekworo.
DEU 4:25 Mgbe ị ga-amụ ụmụ, nwekwa ụmụ ụmụ, mgbe unu birila ọtụtụ oge nʼala ahụ, ọ bụrụ na unu emerụọ onwe unu site nʼimere onwe unu ụdị arụsị ọbụla, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke unu, ma kpasuo ya iwe
DEU 4:26 ana m akpọku eluigwe na ụwa ka ha bụrụ ndị akaebe mụ na unu taa, na a ga-ala unu nʼiyi ngwangwa nʼala ahụ bụ nke unu na-agafe Jọdan inweta. Unu agaghị ebi ogologo oge nʼebe ahụ, nʼihi na a ga-ekpochapụ unu.
DEU 4:27 Onyenwe anyị ga-eme ka unu gbasasịa nʼetiti mba ndị ọzọ. Ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole ga-afọdụ ndụ nʼetiti mba ndị ahụ Onyenwe anyị ga-achụga unu.
DEU 4:28 Nʼebe ahụ, unu ga-efe chi ndị bụ ọrụ aka mmadụ nke e ji osisi tụọ na nke e ji nkume pịa, nke na-adịghị ahụ ụzọ, nke na-adịghị anụ ihe, nke na-apụghị iri nri ma ọ bụkwanụ ịnụ isisi.
DEU 4:29 Ma ọ bụrụ na unu anọrọ nʼebe ahụ chọọ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ga-achọtakwa ya, mgbe unu ji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile chọọ ya.
DEU 4:30 Mgbe mkpagbu bịara, mgbe ihe ilu ndị a bịakwasịrị unu nʼoge dị nʼihu, unu ga-emesịa lọghachikwute Onyenwe anyị Chineke unu, unu ga-egekwa ntị nʼihe ọ ga-agwa unu.
DEU 4:31 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ Chineke na-eme ebere. Ọ gaghị agọnarị unu maọbụ laa unu nʼiyi, maọbụ chefuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu ha gbara, nke o ji iyi ọ ṅụrụ mesie ike.
DEU 4:32 Nyochaanụ ihe mere nʼoge gara aga, tupu a mụọ unu, na tupu Chineke ekee mmadụ nʼụwa. Jụọnụ ajụjụ nʼụwa niile, jụta ma ihe ukwu dị otu a o metụla mgbe ọbụla.
DEU 4:33 O nweela ndị mmadụ nụrụ olu Chineke mgbe o si nʼọkụ gwa ha okwu dịka unu mere, ma ha anwụghị?
DEU 4:34 O nweela chi ọzọ nwara ka o site na mba ọzọ nwetara onwe ya otu mba, site nʼihe nwalee, site nʼihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche, site nʼagha, nʼaka dị ike, na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, maọbụ nʼihe dị oke egwu dị iche iche, dịka ihe niile nke Onyenwe anyị Chineke unu mere nʼala Ijipt nʼihu anya unu abụọ?
DEU 4:35 O gosiri unu ihe ndị a ka unu mara na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie, na ọ dịkwaghị onye ọzọ ma ọ bụghị ya.
DEU 4:36 O sitere nʼeluigwe mee ka unu nụ olu ya maka ịdọ unu aka na ntị. Nʼụwa, o mere ka unu hụ oke ogidi ọkụ ahụ o wuru, unu nụkwara olu ya nʼetiti ọkụ ahụ.
DEU 4:37 Nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe nna nna unu nọ na nʼihi nhọpụta ọ họpụtara ụmụ ụmụ ha, ka o ji si nʼIjipt dupụta unu nʼihu ya. Ọ bụkwa ike aka ya ka o ji mezuo nke a.
DEU 4:38 Ka o site nʼihu unu chụpụ mba dị ukwuu na ndị dị ike, ma kpọbata unu nʼala ha, inye unu ala ahụ dịka ihe nketa unu, dị ka o si dị taa.
DEU 4:39 Matanụ nke ọma, ma nabata okwu a nʼobi unu na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa. O nwekwaghị chi ọzọ dị ma ọ bụghị ya.
DEU 4:40 Debenụ ụkpụrụ ya na iwu ndị a niile m na-enye unu taa, ka ihe niile gaara unu na ụmụ unu nke ọma, ka unu biekwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye unu ruo mgbe niile.
DEU 4:41 Mgbe ahụ, Mosis họpụtara obodo atọ nʼofe ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan,
DEU 4:42 ebe onye ọbụla gburu mmadụ ga-agbaba ọsọ ndụ, ma ọ bụrụ na ha gburu onye agbataobi ha na-amaghị ama, na-akpọghị ya asị na mgbe gara aga. Ọ ga-agbaba nʼotu ime obodo ndị a ichebe ndụ ya.
DEU 4:43 Obodo ndị ahụ bụ, Beza, nke dị nʼugwu elu ya dị larịị nʼime ọzara. A họpụtara ya maka ebo Ruben. Ramọt, nke dị na Gilead, maka ebo Gad, na Golan, nke dị na Bashan, maka ebo Manase.
DEU 4:44 Nke a bụ iwu Mosis chere nʼihu ụmụ Izrel.
DEU 4:45 Ndị a bụ ihe ama, na ụkpụrụ, na iwu Mosis nyere ụmụ Izrel nke ha aghaghị idebe mgbe ha si nʼIjipt pụta
DEU 4:46 na ndagwurugwu Bet-Peoa nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, bụ onye Mosis na ndị Izrel meriri nʼagha mgbe ha si nʼIjipt pụta.
DEU 4:47 Ndị Izrel nwetaara onwe ha ala ya na ala Ọg, eze Bashan. Eze abụọ ndị a bụ eze ndị Amọrait ndị ala ha dị nʼọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan.
DEU 4:48 Ala a sitere nʼAroea, nʼọnụ mmiri Anọn ruo nʼugwu Siriọn (ya bụ ugwu Hemon),
DEU 4:49 ruo nʼala Araba niile, nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, ruokwa nʼOsimiri Nnu, nʼala ala ugwu Pisga.
DEU 5:1 Mosis kpọkọtara Izrel niile gwa ha okwu sị, Geenụ ntị, unu Izrel, nʼụkpụrụ ndị a na iwu ndị a niile m na-agụpụta na ntị unu taa, mụtanụ ha, hụkwanụ na unu debere ha!
DEU 5:2 Anyị na Onyenwe anyị Chineke anyị gbara ndụ nʼugwu Horeb.
DEU 5:3 Ọ bụghị Onyenwe anyị na nna nna anyị ha gbara ndụ, kama ọ bụ anyị na ya, anyị niile ndị dị ndụ taa.
DEU 5:4 Onyenwe anyị sitere nʼetiti ọkụ gwa unu okwu ihu na ihu nʼugwu ahụ.
DEU 5:5 E guzoro m nʼetiti unu na Onyenwe anyị mgbe ahụ, ikwupụtara unu okwu Onyenwe anyị, nʼihi na unu tụrụ egwu ọkụ ahụ, unu arịgoghịkwa nʼugwu ahụ. Ọ sịrị:
DEU 5:6 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ịbụ ohu.
DEU 5:7 “Gị enwela chi ọzọ tinyere m.
DEU 5:8 Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, nʼoyiyi nke ụdị ọbụla nke yiri ihe dị nʼeluigwe maọbụ nke yiri ihe dị nʼụwa, nʼokpuru ya maọbụ nʼime mmiri, nʼokpuru ụwa.
DEU 5:9 Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị.
DEU 5:10 Ma na-egosi ịhụnanya nye puku ọgbọ niile nke ndị hụrụ m nʼanya, bụ ndị na-edebe ihe niile m nyere nʼiwu.
DEU 5:11 Gị ejikwala aha Onyenwe anyị bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị.
DEU 5:12 Debe ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu.
DEU 5:13 Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile,
DEU 5:14 ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, ehi gị, ịnyịnya ibu gị maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọ bụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị, ka ohu gị nwoke na ohu gị nwanyị zuru ike dịka gị onwe gị si ezu ike.
DEU 5:15 Ị ga-echetakwa na ị bụ ohu nʼala Ijipt, ma Onyenwe anyị Chineke mere ka i si nʼohu pụta. Ọ bụ ike ya dị ukwuu ka o ji napụta gị. Ọ bụ ya mere Onyenwe anyị Chineke gị ji nye iwu na ị ga-edebe ụbọchị izuike nsọ.
DEU 5:16 Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo, ka ihe dịkwara gị mma nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
DEU 5:17 Gị egbula mmadụ.
DEU 5:18 Gị akwala iko.
DEU 5:19 Gị ezula ohi.
DEU 5:20 Gị agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị.
DEU 5:21 Gị enwela anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala agụụ inwetara onwe gị ụlọ onye agbataobi gị, maọbụ nʼebe ala ya, maọbụ ohu ya nwoke, maọbụ ohu ya nwanyị, maọbụ ehi ya, maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi nwere dị.”
DEU 5:22 Iwu ndị a ka Onyenwe anyị sitere nʼolu ike kwupụta nye ọgbakọ unu niile nʼelu ugwu ahụ, site nʼọkụ ahụ na igwe ojii ahụ na oke ọchịchịrị ahụ. O nweghị okwu ọzọ o tụkwasịrị nʼelu ya. O mechara dee ha na mbadamba nkume abụọ, nye m ha.
DEU 5:23 Ma mgbe unu nụrụ oke olu ahụ kwuru okwu site nʼoke ọchịchịrị ahụ, hụkwa ire ọkụ ahụ dị egwu na-enwu nʼelu ugwu, ndịisi unu, ndị ndu ebo ọbụla na ndị okenye unu bịakwutere m.
DEU 5:24 Unu sịrị, “Onyenwe anyị bụ Chineke anyị egosila anyị ebube ya, na ịdị ukwu ya, anyị anụkwala olu ya site nʼime ọkụ ahụ. Taa anyị ahụla na mmadụ pụrụ ịdị ndụ ọbụladị ma Chineke kpanyere ha ụka.
DEU 5:25 Ma ugbu a nʼihi gịnị ka anyị ga-eji nwụọ? Ọkụ a, nke na-enwusi ike ga-erechapụ anyị. Anyị ga-anwụ ma ọ bụrụ na anyị anụ olu Onyenwe anyị Chineke anyị gaa nʼihu.
DEU 5:26 Nʼihi na onye dị nʼetiti mmadụ, nke nụrụ olu Chineke dị ndụ ka ọ na-ekwu okwu site nʼetiti ọkụ, dịka anyị nụrụ ma dịrị ndụ.
DEU 5:27 Gaa nso nụtara anyị ihe Onyenwe anyị Chineke anyị na-ekwu, mgbe ahụ, gwa anyị ihe ọbụla bụ nke ọ gwara gị, anyị ga-anụ, mekwa ya.”
DEU 5:28 Onyenwe anyị nụrụ olu okwu mgbe unu gwara m okwu, Onyenwe anyị sịrị m, “Anụla m ihe ndị a gwara gị. Ihe niile ha kwuru ziri ezi.
DEU 5:29 Lee, ọ ga-adị nnọọ mma ma mkpụrụobi ha dị otu a, ịtụ egwu m, na idebe ihe niile m nyere ha nʼiwu, ka ihe gaara ha na ụmụ ha nke ọma mgbe niile ebighị ebi.
DEU 5:30 “Gaa, gwa ha ka ha laghachi nʼụlọ ikwu ha.
DEU 5:31 Ma gị onwe gị, guzo nʼebe a nʼakụkụ m, ka m nye gị iwu m na ụkpụrụ m niile, ị ga-akụziri ha idebe iwu m, ha aghakwaghị idebe ha nʼala ahụ m gaje inye ha ka ha nweta.”
DEU 5:32 Lezienụ anya ime ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyere unu nʼiwu. Unu esitela na ha wezuga onwe unu gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.
DEU 5:33 Jegharịanụ ije nʼụzọ niile Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu nʼiwu, ka unu dịrị ndụ, baa ụba, ma meekwa ka ndụ unu dị ogologo nʼala ahụ unu na-aga inweta.
DEU 6:1 Ndị a bụ iwu, na ụkpụrụ, na ikpe niile nke Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nyere m nʼiwu ka a kuziere unu ka unu debe, nʼala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.
DEU 6:2 Ihe e ji nye iwu ndị a bụ ka unu na ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, site nʼidebe iwu ya, ogologo ndụ unu niile. Ọ bụrụ na unu emee ya, unu ga-enwe ndụ ogologo.
DEU 6:3 Nụrụ Izrel ma lezie anya nʼirube isi, ka ihe gaara unu nke ọma, ka unu baa ụba nke ukwuu nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, ọ bụladị dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha kwere unu na nkwa.
DEU 6:4 Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu.
DEU 6:5 Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya.
DEU 6:6 Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi.
DEU 6:7 Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
DEU 6:8 Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu.
DEU 6:9 Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụzọ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.
DEU 6:10 Mgbe Onyenwe anyị Chineke ga-akpọbata unu nʼala ahụ ọ ṅụrụ iyi nye nna nna unu ha, bụ Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, na inye unu, ala sara mbara nke jupụtara nʼobodo unu na-ewughị,
DEU 6:11 na ụlọ ihe ọma dị iche iche jupụtara nʼime ya nke unu na-azụghị, na olulu mmiri unu na-egwughị nʼonwe unu, na ubi vaịnị na ọtụtụ osisi oliv unu na-amaghị ndị kụrụ ha, mgbe unu riri ihe rijuo afọ,
DEU 6:12 leruonu anya, ka unu ghara ichefu Onyenwe anyị, onye mere ka unu site nʼala Ijipt pụta, bụ ala ebe unu bụ ohu.
DEU 6:13 Onyenwe anyị bụ Chineke gị, ka ị ga-atụ egwu, naanị ya ka ị ga-efe ofufe, ọ bụkwa aha ya ka ị ga-eji ṅụọ iyi.
DEU 6:14 Unu agbasola chi ndị ọzọ, bụ chi ndị niile a gbara unu gburugburu na-efe.
DEU 6:15 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu, bụ Chineke ekworo. Ọ ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide unu, ọ ga-ekpochapụkwa unu site nʼelu ụwa.
DEU 6:16 Anwala Onyenwe anyị, bụ Chineke gị ọnwụnwa, dịka unu nwara ya na Masa.
DEU 6:17 Lezienụ anya hụ na unu debere iwu niile na ụkpụrụ niile, na ihe ama niile Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu.
DEU 6:18 Meenụ ihe ziri ezi, na nke dị mma nʼanya Onyenwe anyị, ka ihe niile gaara unu nke ọma, ka unu nweekwa ike ịbanye, ma nweta ezi ala ahụ Onyenwe anyị ji ịṅụ iyi kwee nna nna unu ha na nkwa.
DEU 6:19 Ka unu chụpụkwa ndị iro unu niile site nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị nʼonwe ya kwuru.
DEU 6:20 Nʼoge na-abịa, mgbe nwa nwoke gị ga-ajụ gị sị, “Gịnị bụ isi ihe ama ndị a, na ụkpụrụ ndị a, na iwu ndị a Onyenwe anyị Chineke anyị nyere unu?”
DEU 6:21 Ị ga-aza ya sị, “Anyị bụrị ndị ohu Fero nʼala Ijipt, ma site nʼike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị kpọpụtara anyị site nʼala Ijipt.
DEU 6:22 Nʼihu anyị, Onyenwe anyị zipụrụ ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche na ihe ebube dị iche iche, dị ukwuu jọọkwa njọ nʼahụ Ijipt na eze Fero nakwa ndị ụlọ ya niile.
DEU 6:23 Ma o mere ka anyị site nʼIjipt pụta, ịkpọbata na inye anyị ala ahụ o ji ịṅụ iyi kwee nna nna anyị ha na nkwa.
DEU 6:24 Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji nye anyị iwu ka anyị debe ụkpụrụ ndị a niile, na-atụ Onyenwe anyị Chineke anyị egwu, ka anyị bụrụ ndị ihe ga-agara nke ọma ụbọchị niile, ndị a na-edebe ndụ, dịka ọ dị taa.
DEU 6:25 Ọ bụrụ na anyị elezie anya debe iwu ndị a niile Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị, dịka o nyere anyị nʼiwu, anyị ga-abụ ndị na-ejegharị nʼezi omume.”
DEU 7:1 Mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọbata unu nʼala ahụ unu na-abanye inweta, mgbe o si nʼihu unu chụpụ ọtụtụ mba ndị a nʼihu unu, bụ ndị Het, ndị Gigash, ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus, bụ mba asaa ndị dị ike nke ukwuu, baakwa ụba karịa unu;
DEU 7:2 mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere ha nʼaka unu, unu meriekwa ha, lezienụ anya hụ na unu bibiri ha kpamkpam. Ka unu na ha ghara ịgba ndụ, unu emekwarala ha ebere.
DEU 7:3 Unu na ha alụrịtakwala di na nwunye, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụọ, maọbụ lụtara ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom.
DEU 7:4 Nʼihi na nke a ga-eme ka ụmụ unu site nʼiso m tụgharịa, malite ife chi ndị ọzọ. Mgbe ahụ iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, laakwa unu nʼiyi ngwangwa.
DEU 7:5 Kama otu a ka unu ga-eme: tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha, ma suo arụsị ha niile ọkụ.
DEU 7:6 Nʼihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Onyenwe anyị bụ Chineke unu ahọpụtala unu site nʼagbụrụ niile dị nʼụwa a, ka unu bụrụ ndị nke ya, ihe onwunwe ya dị oke ọnụahịa.
DEU 7:7 Ọ bụghị nʼihi na unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị ji họpụta unu, hụ unu nʼanya otu a, nʼezie unu dịkarịsịrị nta nʼọnụọgụgụ.
DEU 7:8 Kama, ọ bụ nʼihi Onyenwe anyị hụrụ unu nʼanya, mezuokwa iyi ọ ṅụrụ nye nna nna unu ha, ka o ji site nʼaka ya dị ike gbapụta unu site nʼala ebe unu bụ ndị ohu, site nʼike nke Fero, bụ eze Ijipt.
DEU 7:9 Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị bụ Chineke unu bụ Chineke. Ọ bụ Chineke kwesiri ntụkwasị obi, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya ruo puku ọgbọ, nye ndị niile hụrụ ya nʼanya, ndị na-edebe ihe niile o nyere nʼiwu.
DEU 7:10 Ma onye kpọrọ ya asị, ọ na-eji mbibi kwụghachi ya ụgwọ nʼihu ya, ọ gaghị egbu oge ịkwụghachi onye kpọrọ ya asị ụgwọ nʼihu ha.
DEU 7:11 Nʼihi ya, hụ na unu debezuru iwu na ụkpụrụ ndị a m na-enye unu taa.
DEU 7:12 Ọ bụrụ na unu elezie anya, ṅaa ntị nʼiwu ndị a, debe ha, ma mezuokwa ha, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-emezuru unu ọgbụgba ndụ ịhụnanya ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha.
DEU 7:13 Ọ ga-ahụ unu nʼanya, gọzie unu, meekwa ka unu baa ụba nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-agọzi unu nʼọmụmụ, gọzie ihe ọkụkụ nke ala unu, ọka unu, na mmanya ọhụrụ unu, na mmanụ unu, na ụmụ ehi unu mụrụ, na ụmụ igwe atụrụ unu mụrụ, nʼala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu ha iyi inye unu.
DEU 7:14 A ga-agọzi unu karịa mba ndị ọzọ niile dị nʼụwa. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị ga-anọ na-amụtaghị nwa, ọ dịkwaghị anụ ụlọ unu ga-agba aka nwa.
DEU 7:15 Onyenwe anyị ga-ewepụrụ unu ọrịa niile. Ọ gaghị ekwe ka ọrịa ndị Ijipt ọbụla, nke unu na-echeta nke ọma dakwasị unu, ọrịa ndị a niile ka ọ ga-eme ka ọ bịakwasị ndị iro unu!
DEU 7:16 Mba ọbụla Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere unu nʼaka ka unu ga-ala nʼiyi. Unu emerela ha ebere, unu efekwala chi niile ha, nʼihi na nke a ga-abụrụ unu ihe ịma nʼọnya.
DEU 7:17 Ma eleghị anya, unu ga na-eche nʼime onwe unu sị, “Mba ndị a dị ike karịa anyị, olee otu anyị ga-esi chụpụ ha?”
DEU 7:18 Ma unu atụla egwu! Naanị chetanụ ihe Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere Fero na ndị Ijipt niile.
DEU 7:19 Unu ji anya unu hụ ọnwụnwa ukwuu niile, ihe ịrịbama niile na ihe ebube niile, nʼaka ahụ dị ike na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, nke Onyenwe anyị bụ Chineke unu ji kpọpụta unu. Onyenwe anyị bụ Chineke ga-emekwa otu ihe ahụ nʼebe ndị niile a unu na-atụ egwu ugbu a.
DEU 7:20 Karịsịa, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ezipụ ebu nʼetiti ha tutu ruo mgbe ọ bụladị ndị fọdụrụ ndụ, ndị ahụ ga-ezo onwe ha site nʼebe unu nọ, ghọrọ ndị e bibiri.
DEU 7:21 Unu amala jijiji nʼihu ha, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu bụ Chineke dị ukwuu, dịkwa egwu.
DEU 7:22 Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ga-achụpụ mba ndị a ntakịrị ntakịrị. Ọ gaghị ekwe ka unu chụpụ ha otu ugboro, ma ọ bụghị ya, ụmụ anụ ọhịa ọjọọ ga-amụba megide unu.
DEU 7:23 Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ha nʼaka unu, ọ ga-etinye ha oke ọgbaaghara nʼobi, tutu ruo mgbe ha lara nʼiyi.
DEU 7:24 Eze ha niile ka ọ ga-enyefe nʼaka unu, unu ga-ehichapụkwa aha ha nʼelu ụwa. Ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzo nʼihu unu, nʼihi na unu ga-ebibi ha niile.
DEU 7:25 Kpọọnụ arụsị niile nke apịrị apị nke chi niile ha ọkụ. Unu enwela anya ukwu nʼebe ọlaọcha maọbụ ọlaedo dị ha nʼahụ dị. Unu ewerela ya ka ọ bụrụ nke unu, ka unu ghara ịbụ ndị ọ matara nʼọnya, nʼihi na ọ bụ ihe arụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
DEU 7:26 Unu ewebatala ihe arụ ọbụla nʼụlọ unu, ka unu ghara ịbụ ihe e debere iche nye mbibi dịka ya. Kpọọnụ ihe arụ ahụ asị, ledakwanụ ya anya, nʼihi na ihe e debere iche nye mbibi ka ọ bụ.
DEU 8:1 Lezie anya hụ na i debezuru iwu ndị a niile m nyere gị taa. Ọ bụrụ na i debe ha, ọ bụghị naanị na ị ga-adị ndụ, kama ị ga-amụba, banyekwa inweta ala ahụ Onyenwe anyị kwere nna nna gị ha na nkwa.
DEU 8:2 Chetakwa otu Onyenwe anyị bụ Chineke gị si duo gị nʼime ọzara iri afọ anọ ndị a niile. O wedara mmụọ gị ala, nwakwaa gị ọnwụnwa ịmata ihe dị gị nʼobi, ịchọpụta ma ị ga-edebekwa iwu ya.
DEU 8:3 E, o wedatara mmụọ gị ala mgbe o mere ka ihe oriri kọ gị, mgbe o mere ka i rie mánà, nri ahụ gị na nna gị na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi gị na izi gị na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ nʼokwu niile nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.
DEU 8:4 Iri afọ anọ ndị a niile, uwe gị akaghị nka, ụkwụ gị azakwaghị aza.
DEU 8:5 Nʼihi ya, mata nke a nʼobi gị, na dịka nna si adọ nwa ya aka na ntị, otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị si adọ gị aka na ntị.
DEU 8:6 Debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị. Na-ejegharị ije nʼụzọ ya, ma na-atụkwa ya egwu.
DEU 8:7 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị na-ewebata gị nʼala mara mma, bụ ala nwere iyi, na ọdọ mmiri, ala nwere mmiri nke si nʼime ya na-asọpụta asọgharị nʼugwu na ndagwurugwu,
DEU 8:8 ọ bụ ala na-epu ọka wiiti na ọka balị, na osisi vaịnị, na osisi fiig, na osisi pomegranet, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ.
DEU 8:9 Ọ bụkwa ala jupụtara nʼihe oriri, ebe a na-agaghị enwe ụkọ nri. Ọ bụ ala ebe igwe jupụtara nʼime ya dị ka ha bụ nkume, ala ebe ọla jupụtakwara nʼugwu ya niile.
DEU 8:10 Mgbe i riri rijuo afọ, too Onyenwe anyị Chineke gị nʼihi ala mara mma nke o nyere gị.
DEU 8:11 Ma lezie anya ka ị ghara ichefu Onyenwe anyị Chineke gị, na-edebeghị iwu ya niile, na ikpe ya niile, na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa.
DEU 8:12 Ka ọ ghara ị bụ, mgbe i riri rijuru afọ, mgbe i wuuru onwe gị ezi ụlọ dị mma birikwa nʼime ha,
DEU 8:13 mgbe igwe ehi na igwe atụrụ gị mụbara, mgbe ọlaọcha na ọlaedo gị mụbara, na mgbe ihe niile i nwere mụbara.
DEU 8:14 Kpachara anya hụ na nganga abanyeghị gị nʼobi, ime ka i chefuo Onyenwe anyị Chineke gị onye mere ka ị site nʼIjipt, sitekwa nʼala ịbụ ohu pụta.
DEU 8:15 Onye duuru gị nʼime ọzara ukwu ahụ dị egwu, ebe agwọ ọjọọ na akpị jupụtara, ebe na-ekpo ọkụ, nke mmiri na-adịghị. O sitere na nkume nye gị mmiri ọṅụṅụ
DEU 8:16 O ji mánà nyejuo gị afọ nʼọzara, mánà ahụ nna gị ha na-amaghị ihe ọ bụ na mbụ. O mere ya nʼihi iweda mmụọ gị ala, na ịnwale gị, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma.
DEU 8:17 I nwere ike kwuo sị, “Ọ bụ site nʼike aka m ka m ji baa ụba.”
DEU 8:18 Ma cheta Onyenwe anyị Chineke gị, nʼihi na ọ bụ ya onwe ya na-enye gị ike i ji akpata akụ, ime ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike, bụ nke ọ ṅụrụ nna nna gị ha nʼiyi, dịka ọ dị taa.
DEU 8:19 Ma ọ bụrụ na i chefuo Onyenwe anyị bụ Chineke gị, gbasoo chi ndị ọzọ, fee ha ofufe ma kpọọkwa isiala nye ha, ana m agba ama megide gị taa na ị ghaghị ịla nʼiyi.
DEU 8:20 Ọ bụrụ na unu egeghị ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke unu, ime ihe ọ chọrọ, ọ ga-ala unu nʼiyi, dịka o si bibie mba ndị a niile dị iche iche ọ na-ebibi nʼihi unu.
DEU 9:1 Nụrụ, Izrel! Taa ka ị na-aga ịgafe osimiri Jọdan ịbanye ka inweta ala mba ndị dị ukwuu na ndị dị ike karịa gị, inweta obodo ndị dị ukwuu nke nwere mgbidi ha dị elu ruo nʼeluigwe.
DEU 9:2 Ndị bi nʼime ha bụ ndị Anak, ndị gbara dimkpa, too ogologo nke ukwuu. Ị maara banyere ha. Ị nụkwaala ka e kwuru sị, “Onye pụrụ iguzo onwe ya nʼihu ụmụ Anak?”
DEU 9:3 Ma mata taa na Onyenwe anyị Chineke gị bụ onye na-aga nʼihu gị dịka ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ ga-ala ha nʼiyi. Ọ bụkwa ya ga-eme ka unu lụgbuo ha, chụpụ ha, bibiekwa ha ngwangwa dịka Onyenwe anyị kwere gị na nkwa.
DEU 9:4 Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼihu gị chụpụ ha, asịla onwe gị, “Onyenwe anyị akpọbatala m nʼebe a, ka m nweta ala a nʼihi ezi omume m.” Mba, ọ bụ naanị nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼala ahụ ka Onyenwe anyị ji esite nʼihu gị chụpụ ha.
DEU 9:5 Ọ bụghị nʼihi ezi omume gị, maọbụ izi ezi nke obi gị ka ị ga-eji nweta ala ahụ, kama ọ bụ nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼime ya ka Onyenwe anyị Chineke gị ga-eji achụpụ ha site nʼihu gị. Ọ na-emekwa ya nʼihi imezu nkwa ahụ o kwere nna nna gị ha bụ Ebraham, Aịzik, na Jekọb.
DEU 9:6 Ya mere, ghọta ya nke ọma na Onyenwe anyị Chineke gị anaghị enye gị ezi ala a ka inweta ya nʼihi ezi omume gị, nʼihi na unu bụ ndị isiike.
DEU 9:7 Chetakwa nke a ma echefukwala otu i si kpasuo Onyenwe anyị Chineke gị iwe, mgbe mgbe, nʼime ọzara. Site nʼụbọchị ị hapụrụ Ijipt tutu ruo taa, ka ị na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ.
DEU 9:8 Unu kpasuru Onyenwe anyị iwe nʼugwu Horeb, ya mere o jiri were iwe laa unu nʼiyi.
DEU 9:9 Mgbe m rigooro nʼelu ugwu ahụ ịnata mbadamba nkume ndị ahụ bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na unu, anọrọ m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, ọ dịghị nri m riri, ọ dịghịkwa mmiri m ṅụrụ.
DEU 9:10 Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, nke eji mkpịsịaka Chineke dee. Edekwasịrị nʼelu ha iwu niile nke Onyenwe anyị gwara unu nʼugwu ahụ site nʼetiti ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ.
DEU 9:11 Mgbe iri abalị anọ gwụrụ Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ.
DEU 9:12 Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị gwara m sị m, “Rịdata ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i si nʼIjipt dupụta, emerụọla onwe ha, ha emeela ngwangwa iwezuga onwe ha site nʼiwu m nyere ha. Ha emeerela onwe ha nwa ehi a kpụrụ akpụ, ka ọ bụrụ chi ha.”
DEU 9:13 Onyenwe anyị gwara m sị, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike nʼezie.
DEU 9:14 Hapụ m, ka m kpochapụ ma hichapụkwa aha ha site nʼokpuru eluigwe. Aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ike karịa, dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ karịa ha.”
DEU 9:15 Ya mere, atụgharịrị m malite isi nʼugwu ahụ na-enwu ọkụ rịdata, ejikwa m mbadamba nkume abụọ nke ọgbụgba ndụ ahụ nʼaka m.
DEU 9:16 Mgbe m lepụrụ anya, ahụrụ m na unu emeela mmehie megide Onyenwe anyị Chineke unu. Unu akpụọlara onwe unu arụsị nʼụdị nwa ehi. Unu esitela nʼịgbaso iwu Onyenwe anyị wezuga onwe unu ọsịịsọ.
DEU 9:17 Mgbe ahụ, ewere m mbadamba nkume abụọ ahụ, tụpụ ha site nʼaka m abụọ, kụrie ha nʼihu unu.
DEU 9:18 Mgbe ahụ, adara m nʼala ọzọ nʼihu Onyenwe anyị. Iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, erighị m nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ọbụla, nʼihi mmehie niile unu mere. Unu mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo ya iwe nke ukwuu.
DEU 9:19 Atụrụ m egwu iwe na ọnụma nke Onyenwe anyị, nʼihi na iwe ya dị ukwuu megide unu ruo na ikpochapụ unu. Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gere ntị nʼarịrịọ m.
DEU 9:20 Nʼoge ahụ, Erọn nʼonwe ya, nọrọ nʼoke nsogbu, nʼihi na Onyenwe anyị were iwe megide ya, chọọ ibibi ya, ma arịọrọ m Onyenwe anyị arịrịọ nʼihi ya.
DEU 9:21 Mgbe ahụ, eweere m ngwa ọrụ mmehie unu, ya bụ nwa ehi ahụ unu kpụrụ, kpọọ ya ọkụ, tipịa ya, gwerie ya nke ọma dịka ntụ, wụnye ntụ ya nʼime mmiri nke si nʼugwu na-asọpụta.
DEU 9:22 Ọzọkwa, unu kpasuru Onyenwe anyị iwe na Tabera, na Masa, ọ bụladị na Kibrọt Hataava.
DEU 9:23 Mgbe Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ unu ọ sị unu, “Gaanụ nweta ala ahụ m nyere unu.” Ma unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ekwenyeghị maọbụ rubere ya isi.
DEU 9:24 Site nʼụbọchị m maara ndị unu bụ, ọ dịbeghị mgbe unu na-enupughị isi nʼebe Onyenwe anyị nọ.
DEU 9:25 Ọ bụ ya mere m jiri daa nʼala nʼihu Onyenwe anyị iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, nʼihi na Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-ala unu nʼiyi.
DEU 9:26 Ekpere m ekpere nʼoge ahụ nye Onyenwe anyị sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, alala ndị gị nʼiyi, nʼihi na ha bụ ihe nketa gị, bụrụkwa ndị i ji ike aka gị na ebube gị gbapụta site nʼIjipt.
DEU 9:27 Elekwasịla nnupu isi ha na isiike ha anya, kama, cheta nkwa gị, nke i kwere ndị ohu gị, Ebraham, Aịzik, na Jekọb. Biko, agụnyela ndụ ọjọọ ha, na mmehie ha megide ha.
DEU 9:28 Ma ọ bụghị otu a, ndị obodo ahụ nke i si na ya kpọpụta anyị ga-asị, ‘Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị apụghị inye ha ala o kwere ha na nkwa ka o ji laa ha nʼiyi. Nʼihi na ọ kpọrọ ha asị, ka o ji kpọbata ha nʼime ọzara mee ka ha nwụọ nʼebe ahụ.’
DEU 9:29 Ma ha bụ ndị gị, ha bụkwa ihe nketa gị. Ha bụ ndị i sitere nʼike gị dị egwu na ike nke aka gị kpọpụta site nʼIjipt.”
DEU 10:1 Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara m, sị, “Wapụta mbadamba nkume abụọ dịka nke mbụ, were ha bịakwute m nʼelu ugwu. Ọzọ, wuokwara onwe gị igbe osisi.
DEU 10:2 Aga m edekwasị nʼelu mbadamba nkume ndị a, okwu niile nke dị nʼelu mbadamba nkume ndị mbụ, bụ nke ị tụpịasịrị. Ị ga-etinyekwa ha nʼime igbe ahụ.”
DEU 10:3 Ya mere, eji m osisi akashia kwaa igbe ahụ. A wapụtakwara m mbadamba nkume abụọ yiri ndị nke mbụ, were ha rigoro ugwu ahụ.
DEU 10:4 Onyenwe anyị dere nʼelu mbadamba nkume ahụ ihe ndị ahụ o dere na mbụ, bụ iwu iri ndị ahụ o gwara unu nʼelu ugwu site nʼime ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ. Onyenwe anyị nyekwara m ha.
DEU 10:5 Mgbe m si nʼugwu ahụ rịdata, etinyere m mbadamba nkume abụọ ahụ nʼime igbe ahụ m kwara, dịka Onyenwe anyị nyere m nʼiwu. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
DEU 10:6 (Ụmụ Izrel gara ije site nʼolulu mmiri nke Bene Jaakan garuo Mosera, nʼebe ahụ ka Erọn nọ nwụọ, e lie ya nʼebe ahụ. Elieza, bụ ọkpara ya nọchiri ọnọdụ ya dịka onye nchụaja.
DEU 10:7 Site nʼebe ahụ, ha gagidere ije ruo Gudgoda, sitekwa na ya ruo Jotbata, ala nke iyi na-asọ asọ juru nʼime ya.
DEU 10:8 Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị kewapụtara ebo Livayị ibu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na iguzo nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi na ikwupụta ngọzị nʼaha ya, dịka ha sị eme ruo taa.
DEU 10:9 Ọ bụ nke a mere ndị Livayị enweghị oke maọbụ ihe nketa nʼetiti ndị Izrel ibe ha; Onyenwe anyị bụ ihe nketa ha, dịka Onyenwe anyị Chineke unu gwara ha.)
DEU 10:10 Ugbu a, anọọla m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, dịka m mere nʼoge mbụ, Onyenwe anyị gekwara m ntị nʼoge ugbu a. Ọ bụghị ọchịchọ Onyenwe anyị ibibi unu.
DEU 10:11 Onyenwe anyị gwara m, “Bilie, gaa ka i duru ndị a gaa na njem ha, ka ha banye, ma nwetakwa ala ahụ nke m kwere nna nna ha na nkwa inye ha.”
DEU 10:12 Ugbu a, Izrel, gịnị ka Onyenwe anyị Chineke gị na-ana nʼaka gị ma ọ bụghị ka ị tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke gị, jee ije na nrube isi nye ya, ịhụ ya nʼanya, na iwere obi gị niile na mmụọ gị niile fee ya ofufe,
DEU 10:13 na ilezi anya debezuo iwu na ụkpụrụ Onyenwe anyị, ndị m na-enye gị taa, nʼihi ọdịmma gị.
DEU 10:14 Ụwa na eluigwe na ebe niile kachasị elu nke eluigwe, na ihe niile dị nʼime ha, bụ nke Onyenwe anyị Chineke gị.
DEU 10:15 Ma Onyenwe anyị nwere mmasị nʼahụ nna nna unu ha, hụkwa ha nʼanya, ọ họrọ unu, na naanị ụmụ ha niile, site nʼetiti mba niile dịka ọ dị taa.
DEU 10:16 Nʼihi nke a, biekwanụ obi unu ugwu, kwụsịkwanụ ibi ndụ nke isiike.
DEU 10:17 Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke unu bụ Chineke kachasị chi niile, bụrụkwa Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile. Chineke ukwu ahụ, onye dị ike dịkwa egwu, onye na-adịghị ele mmadụ anya nʼihu, ọ nakwaghị eri ngarị.
DEU 10:18 Ọ na-alụrụ ndị na-enweghị nna, na ụmụ nwanyị na-enweghị di ọgụ. Ọ na-ahụ ndị ọbịa nʼanya, na-enyekwa ha nri na uwe.
DEU 10:19 Ya mere, unu onwe unu kwa, hụnụ ndị ọbịa nʼanya, nʼihi na unu onwe unu bụrụrị ndị ọbịa nʼala Ijipt.
DEU 10:20 Tụọ Onyenwe anyị Chineke gị egwu, feekwa ya ofufe. Ya ka ị ga-arapara nʼahụ, ọ bụkwa naanị nʼaha ya ka ị ga-aṅụ iyi.
DEU 10:21 Ọ bụ ya bụ onye ị ga-eto otuto, ọ bụ ya bụ Chineke gị, onye rụrụ gị ọrụ ndị ahụ dị oke egwu na ebube, nke gị onwe gị ji anya gị hụ.
DEU 10:22 Nna nna unu ndị gara nʼIjipt dị naanị iri mmadụ asaa, ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke gị emeela ka ịmụbaa dịka kpakpando nke mbara igwe.
DEU 11:1 Hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, na-edebezukwa ikpe ya na ụkpụrụ ya na ihe niile o nyere nʼiwu.
DEU 11:2 Chetanụ taa na ọ bụghị ụmụ unu, kama ọ bụ unu onwe unu jiri anya unu hụ ịdọ aka na ntị Onyenwe anyị Chineke unu. Ọ bụ unu hụrụ ịdị ukwuu ya, ịdị ike ya, ịrụsị ọrụ ike nke ike ya,
DEU 11:3 ihe ịrịbama ya niile na ihe niile o mere nʼIjipt, otu o si megide Fero eze Ijipt na ndị ala Ijipt niile.
DEU 11:4 Unu hụrụ ihe o mere ndị agha Ijipt na ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha. Otu o si mee ka ha laa nʼiyi nʼime Osimiri Uhie, mgbe ha na-achụ unu ọsọ, na otu Onyenwe anyị si wetara ha ịla nʼiyi ebighị ebi.
DEU 11:5 Ọ bụghị ụmụ unu hụrụ ihe o meere unu nʼoge ahụ niile unu nọ nʼọzara tutu unu erute nʼebe a,
DEU 11:6 na ihe o mere Datan na Abiram, ụmụ Eliab, ndị si nʼebo Ruben, otu ala si meghee ọnụ ya loda ha, ha na ezinaụlọ ha, ụlọ ikwu ha na ihe ọbụla nke dị ndụ ha nwere nʼetiti Izrel niile.
DEU 11:7 Ma ọ bụ anya unu hụrụ oke ihe ịtụnanya ndị a niile Onyenwe anyị mere.
DEU 11:8 Lezienụ anya debe iwu ndị a m na-enye unu taa, ka unu nwee ike, baa bichikwaa ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta,
DEU 11:9 ka unu bie ogologo ndụ nʼime ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna unu ha, na ụmụ ụmụ ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
DEU 11:10 Nʼihi na ala a unu na-aga ịbanye nʼime ya inweta adịghị ka ala Ijipt, ebe unu si pụta, ebe ị na-agha mkpụrụ gị, were ụkwụ tụwara mmiri ụzọ, dịka a na-eme nʼubi akwụkwọ nri.
DEU 11:11 Ma ala unu na-agafe Jọdan inweta bụ ala nwere ugwu na ndagwurugwu, nke na-aṅụ mmiri ozuzo si nʼeluigwe.
DEU 11:12 Ọ bụ ala nke Onyenwe anyị Chineke unu nʼonwe ya na-elekọta! Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, sitekwa na mbido afọ ruo nʼọgwụgwụ afọ, anya ya adịghị apụ na ya.
DEU 11:13 Ya mere, ọ bụrụ na unu ga-eji ntụkwasị obi rube isi nʼiwu ya niile, nke m na-enye unu taa, ọ bụrụkwa na unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile hụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, ọ bụrụkwa na unu ga-efe ya ofufe,
DEU 11:14 ọ ga na-ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ, nke ga-eme ka ọka unu mịa mkpụrụ hiri nne, ka unu nwee ọtụtụ vaịnị, nweekwa mmanụ oliv.
DEU 11:15 Ọ ga-eme ka anụ ụlọ gị nwee ahịhịa ha ga-ata, gị onwe gị ga-enwekwa ihe oriri dị ukwuu. Afọ ga-ejukwa gị nʼihe i nwere.
DEU 11:16 Ma lezienụ anya, ka ahapụ ịrafu obi unu mee ka unu wezuga onwe unu, bido ife chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha.
DEU 11:17 Mgbe ahụ, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ nʼebe unu nọ, ọ ga-agbachi eluigwe, mmiri agaghị ezo, ala agaghị epupụtakwa ihe ubi, unu ga-alakwa nʼiyi nʼotu ntabi anya, nʼezi ala ahụ Onyenwe anyị na-enye unu.
DEU 11:18 Meenụ ka okwu m ndị a dịgide nʼobi unu na nʼime mmụọ unu. Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu.
DEU 11:19 Kuzierenụ ha ụmụ unu, na-ekwu ihe banyere ha mgbe ị na-anọdụ nʼụlọ gị, na mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
DEU 11:20 Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.
DEU 11:21 Ka ụbọchị ndụ unu na nke ụmụ unu dị ogologo nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya, nke Onyenwe anyị kwere nna unu na nkwa. Dịka ogologo ụbọchị niile ha nke eluigwe dị nʼelu, ụwa dịkwa nʼokpuru ya.
DEU 11:22 Ọ bụrụ na unu elezie anya debe iwu niile m na-enye unu taa, na-ahụkwa Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, na-eso ụzọ ya, na-adaberekwa na ya,
DEU 11:23 Onyenwe anyị ga-achụpụ mba niile bi nʼala ahụ unu na-aga inweta, unu ga-anapụkwa ha ala ahụ, ọ bụladị na ha buru ibu, siekwa ike karịa unu.
DEU 11:24 Ebe ọbụla unu zọnyere ụkwụ unu nʼala ahụ aghọọla nke unu, site na ndịda Negeb ruo Lebanọn, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo Osimiri Mediterenịa. Ha ga-abụ nke unu.
DEU 11:25 Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ imegide unu nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-emenye ha egwu na ụjọ nʼafọ nʼụzọ ọbụla unu na-aga, dịka o kwere na nkwa.
DEU 11:26 Lee, taa, ana m eche nʼihu unu ngọzị Onyenwe anyị na ọbụbụ ọnụ.
DEU 11:27 Ngọzị ga-adịrị unu ma ọ bụrụ na unu edebe iwu Onyenwe anyị Chineke unu, nke m na-enye unu taa.
DEU 11:28 Nkọcha ahụ ga-adị ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu niile nke Onyenwe anyị, bụ Chineke unu, wezuga onwe unu nʼụzọ ahụ nke m nyere unu nʼiwu taa site nʼịgbaso chi ndị ọzọ, nke unu na-amaghị.
DEU 11:29 Mgbe Onyenwe anyị Chineke unu mere ka unu nweta ala ahụ, a ga-esite nʼelu ugwu Gerizim kwupụta ngọzị ga-adịrị unu, a ga-esitekwa nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ ga-adakwasị unu.
DEU 11:30 Gerizim na Ebal bụ ugwu dị nʼofe Jọdan, nʼakụkụ okporoụzọ dị nʼọdịda anyanwụ. Ọ dị nso nʼebe osisi ukwu ndị ahụ toro na More, nʼala ndị Kenan ahụ bi nʼAraba, nʼakụkụ Gilgal.
DEU 11:31 Nʼihi na unu na-aga ịgafe osimiri Jọdan, ịbanye nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. Mgbe unu nwetara ya biri nʼime ya,
DEU 11:32 hụnụ na unu rubere isi debe iwu niile na ụkpụrụ niile m na-eche nʼihu unu taa.
DEU 12:1 Ndị a bụ iwu na ụkpụrụ niile unu na-aghaghị idebe ogologo ụbọchị niile unu ga-ebi nʼala ahụ, Onyenwe anyị Chineke nna unu ha nyere unu, dịka ihe nweta.
DEU 12:2 Tikpọọnụ ebe niile nke dị nʼelu ugwu niile dị elu na nʼelu ugwu niile dị nta, nakwa nʼokpuru osisi mgbasa ọbụla, bụ ebe mba niile unu na-anapụ ala ha fere chi niile ha ofufe.
DEU 12:3 Kwatuokwanụ ebe ịchụ aja ha niile, tijisie ogidi nsọ ha niile, kpọọkwa osisi Ashera ha ọkụ, gbutukwaanụ arụsị niile a apịrị apị nke chi niile ha. Kpochapụkwanụ aha ha niile site nʼebe niile ahụ.
DEU 12:4 Unu agaghị efe Onyenwe anyị Chineke unu ofufe dịka ndị ahụ na-efe arụsị na-eme.
DEU 12:5 Kama unu chọpụta ebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, site nʼetiti ebo Izrel niile, ebe ọ ga-akpọkwasị aha ya. Nʼebe ahụ ka unu ga-abịakwute ya.
DEU 12:6 Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka unu ga-ewetara Onyenwe anyị aja nsure ọkụ unu, na aja ndị ọzọ niile, na otu ụzọ nʼụzọ iri unu, na onyinye pụrụ iche unu, bụ onyinye unu kwere nkwa inye, na onyinye afọ ofufu unu, na onyinye ụmụ mbụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ unu.
DEU 12:7 Unu na ezinaụlọ unu ga-anọkwa nʼebe ahụ, nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu, rie oriri unu. Nʼihu ya kwa ka unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, nʼihi ihe niile ahụ unu setịpụrụ aka unu ime, na nʼihi ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu gọziri unu.
DEU 12:8 Unu agaghị emekwa ihe masịrị unu, dịka unu si eme taa, nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọbụla o chere na o ziri ezi nʼanya ya,
DEU 12:9 nʼihi na iwu ndị a ebidobeghị ịdị ire, ebe ọ bụ na unu abanyebeghị nʼebe izuike ahụ, na ihe nketa ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu.
DEU 12:10 Kama, mgbe unu gafere osimiri Jọdan, birikwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu dịka ihe nketa, mgbe Onyenwe anyị nyere unu izuike, meekwa ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị iro unu nọ.
DEU 12:11 Mgbe ahụ, unu ga-eweta ihe ndị ahụ niile m nyere unu nʼiwu: aja nsure ọkụ unu niile, na aja ndị ọzọ, na onyinye ahụ pụrụ iche unu kwere nkwa inye, unu ga-eweta ya nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu họpụtara ebe o kpọkwasịrị aha ya.
DEU 12:12 Unu na ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị bi nʼobodo unu, ndị na-enweghị ihe nketa nke aka ha, ga-anọ nʼebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu.
DEU 12:13 Ị gaghị achụ aja nsure ọkụ gị nʼebe ọbụla masịrị gị,
DEU 12:14 ọ bụ naanị nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Ọ ga-ahọpụta otu ebe, nʼala otu ebo. Ọ bụ naanị nʼebe ahụ ka ị ga-esure aja unu niile, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka ị ga-eweta onyinye gị niile.
DEU 12:15 Otu ọ dị, ị pụrụ ịnọ nʼebe ọbụla gbuo anụ ị ga-eri, dịka ọ bụ ele maọbụ mgbada ugbu a. Rie anụ mgbe ọbụla ọ gụrụ gị agụụ, na-erikwa ya mgbe ọbụla i nwetara ya, dịka ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. Ma onye dị ọcha, ma onye na-adịghị ọcha nwere ike iso rie ya.
DEU 12:16 Naanị iwu dị nʼiri anụ ndị a bụ na ị gaghị eri ọbara ya, wụsa ọbara ya nʼala, dịka mmiri.
DEU 12:17 Ma o nweghị onyinye ọbụla a na-enye Onyenwe anyị i kwesiri ịnọ nʼụlọ gị rie. I kwesighị ịnọ nʼụlọ gị rie onyinye ndị a: onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka na mmanya ọhụrụ gị, na nke mmanụ oliv, na ụmụ mbụ nke igwe ehi na igwe ewu na atụrụ gị, na ihe ọbụla i kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu gị, na onyinye ndị ọzọ pụrụ iche.
DEU 12:18 Kama unu ga-eri ha nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, gị onwe gị, na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwanyị, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị si nʼobodo unu niile, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihe niile aka gị rụpụtara.
DEU 12:19 Echefukwala ndị Livayị, gị na ha ga na-enwekọ ihe ndị a niile, ogologo ụbọchị niile i biri nʼala ahụ.
DEU 12:20 Mgbe Onyenwe anyị, bụ Chineke gị mere ka oke ala gị saa mbara, dịka o kwere gị na nkwa, i nwee oke agụụ maka iri anụ na-asị, “Achọrọ m iri anụ,” mgbe ahụ, i nwere ike rie anụ dịka i si chọọ.
DEU 12:21 Ọ bụrụ nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị kpọkwasịrị aha ya dị gị anya site nʼebe i nọ, i nwere ike gbuo anụ ụlọ site nʼigwe ehi maọbụ ewu na atụrụ nke Onyenwe anyị nyere gị, dịka m si nye gị nʼiwu. Gbuo ha nʼobodo ebe i bi, riekwa ha otu ị chọrọ.
DEU 12:22 Rie ha dịka ị ga-esi rie ele maọbụ mgbada. Onye ọbụla nʼime unu nwere ike rie ya, ma onye dị ọcha ma onye na-adịghị ọcha.
DEU 12:23 Ma lezie anya hụ na i righị ọbara, nʼihi na ndụ dị nʼọbara. Ị gaghị erikọta anụ ọbụla na ndụ ya.
DEU 12:24 Erila ọbara, wụsa ya nʼala dịka mmiri.
DEU 12:25 Erila ya, ka ihe si otu a gaara gị na ụmụ ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ị na-eme ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
DEU 12:26 Ma were ihe ndị ahụ niile i doro nsọ, ya na ihe ọbụla i kwere Onyenwe anyị na nkwa gaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta.
DEU 12:27 Chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị, ma anụ na ọbara. A ghaghị ịwụsa ọbara anụ ahụ e ji chụọ aja nʼakụkụ ebe nchụaja nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ma i nwere ike rie anụ ahụ e ji chụọ aja.
DEU 12:28 Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme.
DEU 12:29 Onyenwe anyị Chineke gị ga-ala mba niile bi nʼala ahụ ị na-aga ibuso agha nʼiyi. Ma mgbe i si nʼala ahụ chụpụ ha, ị ga-ebichi nʼala ha.
DEU 12:30 Mgbe ị lachara ha nʼiyi, lezie anya ka ị ghara ịma nʼọnya, site nʼịjụ ajụjụ ka ịjụpụta otu ha si efe chi ha, na-asị, “Mba ndị a o si aṅaa na-efe chi ha ofufe? Anyị ga-emekwa otu a.”
DEU 12:31 Efekwala Onyenwe anyị bụ Chineke gị dịka ha si efe chi ha, nʼihi na mgbe ha na-efe chi ha ofufe, ha na-eme ihe arụ dị iche iche nke Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụladị ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ka ha na-esure nʼọkụ nye chi ha dị iche iche dịka aja.
DEU 12:32 Lezienụ anya hụ na unu na-eme ihe niile bụ nke m nyere unu nʼiwu. Unu etinyela ihe nʼime ya maọbụ wepụkwa ihe site na ya.
DEU 13:1 Ọ bụrụ na onye amụma, maọbụ onye na-akọwa nrọ apụta nʼetiti gị kwee nkwa na ihe ịrịbama maọbụ ihe dị ebube na-aga ime,
DEU 13:2 ọ bụrụkwa na ihe ịrịbama ahụ maọbụ ihe ebube ahụ e kwuru maka ya emezuo, emesịa onye amụma ahụ na-asị, “Ka anyị gbaso chi ndị ọzọ dị iche, ka anyị feekwa ha,” bụ chi ndị ị na-amaghị,
DEU 13:3 egela okwu onye amụma maọbụ ọrọ nrọ ahụ ntị. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu na-ele unu ule ịmata ma unu jikwa obi unu, na uche unu hụ ya nʼanya.
DEU 13:4 Ọ bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka unu ga-eso, naanị ya ka unu ga-atụ egwu. Debenụ iwu ya niile na-erubekwara ya isi, na-ejere ya ozi, jidesiekwa ya ike.
DEU 13:5 A ga-egbu onye amụma ahụ maọbụ onye ọrọ nrọ ahụ nke chọrọ iduhie unu, nʼihi na ọ chọrọ iweta nnupu isi megide Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, onye gbapụtara unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu. Ihe ọ chọrọ ime bụ iduhie gị, ka ị ghara ibi ụdị ndụ ahụ Onyenwe anyị Chineke gị chọrọ ka i bie. Ọnwụ ya ga-eme ka i wezuga ihe ọjọọ site nʼetiti gị.
DEU 13:6 Ọ bụrụ na ezi enyi gị maọbụ nwanne gị nwoke maọbụ nwa gị nwoke maọbụ nwunye gị ị hụrụ nʼanya ejiri aghụghọ gwa gị okwu sị gị, “Bịa ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ ofufe” (bụ chi ndị ị na-amaghị maọbụ nke nna gị ha na-amaghị,
DEU 13:7 chi nke ndị ala ahụ gbara unu gburugburu, ma ha bụ ndị bi gị nso ma ha bụ ndị bi nʼebe dị anya, site nʼotu nsọtụ nke ala ahụ ruo nsọtụ nke ọzọ),
DEU 13:8 ekwenyekwala maọbụ ṅaa ntị nʼihe ọ na-ekwu. Enwekwala obi ebere nʼebe ọ nọ, ekpuchikwala atụmatụ ọjọọ ya niile.
DEU 13:9 Ị ghaghị igbu ha. Buru ụzọ setịpụ aka gị tụọ ya nkume, ka ndị ọzọ soro gị tugbuo ya.
DEU 13:10 Jiri nkume tugbuo ya, nʼihi na ọ chọrọ ime ka i site nʼiso Onyenwe anyị Chineke, wezuga onwe gị, ka ị pụọ, ma chigharịa site nʼiso ya, bụ Onyenwe anyị, onye mere ka i site nʼala Ijipt pụta, ala ebe ị nọ nʼime ya dịka ohu.
DEU 13:11 Izrel niile ga-anụkwa banyere ihe ọjọọ o mere, ha ga-atụkwa ihe ọjọọ dị otu a egwu, ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti gị ga-achọkwa ime ihe ọjọọ dị otu ahụ.
DEU 13:12 Mgbe i bi nʼobodo ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, ọ bụrụ na akụkọ esite nʼotu obodo ndị a ruo gị ntị sị,
DEU 13:13 na ụfọdụ ndị mmadụ jọgburu onwe ha eduhiela ndị obodo ha, na-asị, “Ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ ofufe” (bụ chi ndị ị na-amaghị na mbụ),
DEU 13:14 tupu i mee ihe ọbụla, ị ga-eburu ụzọ jụọ ase, jụpụta nke ọma, ma nyochapụta ma okwu ahụ ọ bụ eziokwu. Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu na-achọpụtakwara nʼihe arụ dị otu a mere nʼetiti unu,
DEU 13:15 ị ghaghị ibuso obodo ahụ agha jiri mma agha gbuo ndị mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ. Ị ghaghị ibibi ya kpamkpam, ma ndị mmadụ ma anụ ụlọ ha.
DEU 13:16 Ihe nkwata niile i si nʼobodo ahụ kwata ka ị ga-ekpokọta nʼotu ebe, nʼama dị nʼetiti obodo ahụ. A ga-akpọkwa ha niile ọkụ, gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ, dịka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Ruo mgbe ebighị ebi, obodo ahụ ga-abụ mkpọmkpọ ebe, a gaghị ewugharịkwa ya ọzọ.
DEU 13:17 Ọ dịghị ihe ndị ahụ e debere nye mbibi nke e kwesiri ịhụ nʼaka gị. Nke a ga-emekwa ka iwe ọkụ Onyenwe anyị dajụọ, ka o gosikwa gị obi ebere. Ọ ga-enwekwa ọmịiko nʼahụ gị, meekwa ka ị baa ụba nʼọnụọgụgụ, dịka o ji ịṅụ iyi kwee nna nna gị ha na nkwa.
DEU 13:18 Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ihe ndị a ma ọ bụrụ na ị na-erubere ya isi, na-edebezukwa iwu ya niile, nke m na-enye gị taa, ma na-eme ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.
DEU 14:1 Unu onwe unu bụ ụmụ Onyenwe anyị Chineke unu, ya mere unu egbula onwe unu mma, maọbụ kpụchapụ agịrị isi dị nso nso egedege ihu unu nʼihi onye nwụrụ anwụ.
DEU 14:2 Nʼihi na onye dị nsọ ka ị bụ nye Onyenwe anyị Chineke gị. Ọ bụkwa gị ka Onyenwe anyị họọrọ site na ndị niile nọ nʼelu ụwa, ị bụ ihe oke ọnụahịa nye ya.
DEU 14:3 Erila ihe ọbụla m kwuru na ọ bụ ihe rụrụ arụ.
DEU 14:4 Ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri: ehi, atụrụ, na ewu,
DEU 14:5 na ele nta, na mgbada, na atụrụ ọhịa, na ewu ọhịa, ele ukwu, na anịgọ bi nʼelu ugwu.
DEU 14:6 Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa, nke na-atagharị ọnụ ka unu ga-eri.
DEU 14:7 Ma otu ọ dị, nʼetiti anụ ndị ahụ na-atagharị nri maọbụ ndị ụkwụ ha wara njakpa, ndị a ka unu na-agaghị eri, ịnyịnya kamel, na ewi maọbụ ewi nkume, na anụ ndị ọzọ yiri ha, ọ bụ ezie na ha na-atagharị ọnụ, ma ha enweghị ụkwụ wara njakpa. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.
DEU 14:8 Ezi bụkwa anụ na-adịghị ọcha; ọ bụ ezie na o nwere ụkwụ wara njakpa, ma ọ dịghị atagharị nri. Unu agaghị emetụla ozu ha aka maọbụ rie anụ ha.
DEU 14:9 Nʼime ihe niile e kere eke, dị ndụ, biri na mmiri, unu nwere ike iri nke ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa,
DEU 14:10 ma ihe ọbụla nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa, unu erila ha, nʼihi na ha rụrụ arụ.
DEU 14:11 Unu ga-eri nnụnụ ọbụla dị ọcha,
DEU 14:12 ma unu agaghị eri ndị a: ugo, na udele, na udele ojii,
DEU 14:13 na ndagbụ, na ọgankwọ, na ndagbụ dị iche iche,
DEU 14:14 na ugolọma ọbụla dị iche iche,
DEU 14:15 na enyi nnụnụ, na egbe abalị, na nnụnụ oke osimiri, na egbe dị iche iche,
DEU 14:16 na okwukwu nta, na okwukwu ukwu, na okwukwu nwere mpi,
DEU 14:17 na okwolo na udele, na komorant,
DEU 14:18 na ụgbala, na utù dị iche iche, na nnụnụ ọdụ nta, na ụsụ.
DEU 14:19 Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe rụrụ arụ nye unu, unu erila ha,
DEU 14:20 Ma unu nwere ike iri ụmụ ahụhụ ndị ahụ nwere nku, ndị dị ọcha.
DEU 14:21 Unu erila anụ ọbụla nwụrụ anwụ. Ma otu o si dị, onye ọbịa nʼetiti unu nwere ike rie ya. I nwere ike inye ya, maọbụ resi ya onye ahụ, ma erila ya, nʼihi na onye dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị ka ị bụ. Esila nwa ewu maọbụ nwa atụrụ nʼime mmiri ara nne ya.
DEU 14:22 Ị ghaghị inye otu ụzọ nʼụzọ iri nke mkpụrụ ubi gị afọ niile.
DEU 14:23 Ị ga-erikwa mkpụrụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta ka ọ bụrụ ebe obibi ya, ị ga-anọ nʼebe ahụ rie otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka gị, na mmanya vaịnị ọhụrụ gị, na mmanụ oliv gị, na nwa mbụ nke igwe ehi gị, na igwe ewu na atụrụ gị. Ihe e ji eme nke a bụ ka ị mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke gị ụbọchị ndụ gị niile.
DEU 14:24 Ọ bụrụ na ebe Onyenwe anyị họpụtara dị anya, ọ bụrụkwa na Onyenwe anyị Chineke gị agọziela gị ruo na ị pụghị ibu otu ụzọ nʼụzọ iri gị gaa nʼebe ahụ (nʼihi na ebe ahụ Onyenwe anyị họpụtara dị anya),
DEU 14:25 mgbe ahụ, gbanwee otu ụzọ nʼụzọ iri nata ọlaọcha, were ọlaọcha ahụ jee nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara.
DEU 14:26 Were ọlaọcha ahụ zụọ ihe ọbụla ị chọrọ: ehi, na atụrụ, na mmanya, maọbụ mmanya siri ike na-aba nʼanya maọbụ ihe ọbụla ọzọ nke ị chọrọ. Mgbe ahụ, gị na ezinaụlọ gị ga-eri nri nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, ṅụrịakwa ọṅụ.
DEU 14:27 Echefukwala ime ka ndị Livayị soro gị rie ihe ị kpatara, nʼihi na ha enweghị ihe nketa ọbụla, maọbụ ihe ubi dịka gị.
DEU 14:28 Nʼọgwụgwụ afọ atọ ọbụla, ị ga-eweta otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe ubi gị, chịkọta ha nʼebe a ga-echebe ha nʼobodo gị,
DEU 14:29 ka ndị Livayị, ndị na-enweghị ihe nketa nʼetiti gị, na ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei niile nọ nʼobodo gị, bịa nʼebe ahụ were nri ha ga-eri, rijuokwa afọ. Nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị, gọziekwa ọrụ aka gị niile.
DEU 15:1 Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, ị ga-akagbu ụgwọ niile mmadụ ji gị.
DEU 15:2 Otu a ka a ga-esi mee ya: Onye ọbụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ niile onye Izrel ibe ya ji ya. Ọ gaghị elekwa anya na onye agbataobi ya maọbụ nwanna ya ga-akwụ ya ụgwọ ahụ, nʼihi na oge a na-ekwusa mgbaghara ụgwọ Onyenwe anyị eruola.
DEU 15:3 Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ, ma ị ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị.
DEU 15:4 Otu ọ dị, o kwesighị ka ndị ogbenye dịrị nʼetiti gị, nʼihi nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị ka inweta dịka ihe nketa gị, ọ ga-agọzi gị nke ukwuu,
DEU 15:5 ma ọ bụrụ na i rube isi nye Onyenwe anyị Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa.
DEU 15:6 Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị dịka o kwere na nkwa. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ego, ị gaghị anọ nʼụkọ! Ị ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị gị.
DEU 15:7 Ma mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye gị, a sị na e nwee onye ogbenye nʼetiti gị, nke bụ onye Izrel ibe gị, ị gaghị emechi obi gị maọbụ kechie aka gị megide ya,
DEU 15:8 ị ghaghị ịgbazinye ya ihe dị ka o si chọọ.
DEU 15:9 Lezie anya ka ị ghara inwe ụdị echiche ọjọọ a nʼobi gị sị, “Afọ mgbaghara ụgwọ na-abịa nso,” nʼihi ya, i kechie obi gị jụ ibinye nwanna gị nọ na mkpa ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na onye ahụ nọ na mkpa akwaa akwa kpọkuo Onyenwe anyị, a ga-agụ gị dịka onye ikpe mmehie mara.
DEU 15:10 Ị ghaghị inye ha site nʼafọ ofufu, meekwa nke a na-enweghị obi ilu, mgbe ahụ, nʼihi nke a, Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-agọzi gị nʼọrụ gị niile nakwa ihe niile nke ị tinyere aka na ya.
DEU 15:11 A ghaghị inwe ndị ogbenye nʼetiti unu, ọ bụ ya mere iwu a jiri dị mkpa. Gbasapụ aka nʼebe nwanna gị na nʼebe ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa nọ.
DEU 15:12 Ọ bụrụ na onye Hibru ibe gị, ndị nwoke maọbụ ndị nwanyị, eresi gị onwe ha, gbakwaara gị odibo afọ isii, nʼafọ nke asaa, ị ghaghị ịhapụ ha ka ha nwere onwe ha.
DEU 15:13 Mgbe ọ hapụrụ ụlọ gị, ezipụkwala ya nʼaka efu!
DEU 15:14 Ị ga-esite nʼigwe anụ ụlọ gị, na nʼebe ịzọcha ọka gị, na nʼebe ịzọcha vaịnị gị, nye ya onyinye pụrụ iche iji sị ya laa nʼudo. Nye ya onyinye a dịka Onyenwe anyị Chineke gị si gọzie gị.
DEU 15:15 Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt ma Onyenwe anyị bụ Chineke gị gbapụtara gị. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a taa.
DEU 15:16 Ma ọ bụrụ na ohu gị asị gị, “Achọghị m ịhapụ gị,” nʼihi na ọ hụrụ gị na ndị ụlọ gị nʼanya, hụkwa na ihe na-agara gị na ya nke ọma, mgbe gị na ya nọ.
DEU 15:17 Were agịga kpọpuo ntị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ gị. Ọ ga-abụkwara gị ohu ogologo ndụ ya niile. Otu aka ahụ kwa ka ị ga-eme ohu gị nwanyị.
DEU 15:18 Enwela obi mwute mgbe ọbụla ị na-ahapụ ohu gị ka o nwere onwe ya, nʼihi na ị ga-echeta na ọ rụụrụ gị ọrụ afọ isii, ihe i mefukwara erughị ọkara ihe ị gaara eji goo ndị ọrụ. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzikwa gị nʼihe niile ị na-eme.
DEU 15:19 Nwa oke ehi ọbụla maọbụ nwa atụrụ ọbụla maọbụ nwa ewu ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼime igwe anụ ụlọ gị ka ị ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị, ejila nwa mbụ nke ehi gị e buru ụzọ mụọ arụ ọrụ ubi, akpachakwala ajị nwa ewu maọbụ nwa atụrụ ọbụla e buru ụzọ mụọ dị nʼime igwe ewu na atụrụ gị.
DEU 15:20 Gị na ezinaụlọ gị ga-eri anụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị afọ ọbụla nʼebe ọ họpụtara.
DEU 15:21 Ma ọ bụrụ na nwa anụ ọbụla e buru ụzọ mụọ nwere nkwarụ, dịka ngwụrọ maọbụ ìsì maọbụ nkwarụ ọbụla nke jọrọ njọ, ị gaghị eji ya achụ aja nye Onyenwe anyị Chineke gị.
DEU 15:22 Kama, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ gị nʼime ụlọ gị. Onye ọbụla, ma ndị dị ọcha ma onye rụrụ arụ nʼoge ahụ ga-eri ya, dịka onye ọbụla pụrụ iri anụ ele maọbụ anụ mgbada.
DEU 15:23 Ma erila ọbara ya. Wụsa ya nʼala dịka mmiri.
DEU 16:1 Debe ọnwa Abib iche maka ime Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị Chineke gị, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa Abib ka Onyenwe anyị Chineke gị mere ka i si nʼala Ijipt pụta nʼabalị.
DEU 16:2 Ị ga-eji anụ si nʼigwe atụrụ na ehi gị chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja ngabiga nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta dịka ebe obibi nye aha ya.
DEU 16:3 Erila ya na achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee, kama ụbọchị asaa ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, ya bụ, achịcha ahụhụ, iji cheta na i si nʼala Ijipt pụta ngwangwa. Nke a ga-eme ka i nwee ike na-echeta mgbe i sitere nʼala Ijipt pụta, ụbọchị niile nke ndụ.
DEU 16:4 Ka ihe ọbụla na-eko achịcha ghara ịbata nʼezinaụlọ gị abalị asaa ndị ahụ. Unu ahapụkwala anụ ọbụla unu chụrụ nʼaja nʼoge uhuruchi nke ụbọchị mbụ, nọọ ruo ụtụtụ.
DEU 16:5 Ị gaghị achụ aja ngabiga nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị,
DEU 16:6 karịakwa nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara dịka ebe obibi nye ya ka i ga-anọ chụọ ya. Nʼebe ahụ ka ị ga-achụ aja ngabiga gị nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dachara, nʼoge mgbe dịka oge ụbọchị ahụ i sitere nʼIjipt pụta.
DEU 16:7 Ị ga-ahụ ya nʼọkụ riekwa ya nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke ga-ahọpụta. Nʼụtụtụ, ị ga-alaghachikwa nʼụlọ ikwu gị.
DEU 16:8 Ụbọchị isii ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, nʼụbọchị nke asaa, nweenụ mkpọkọta nye Onyenwe anyị Chineke gị, arụkwala ọrụ ọbụla.
DEU 16:9 Gụpụta izu asaa site na mgbe ị malitere itinye mma iwe ihe ubi nʼukwu ọka guzoro eguzo nʼubi gị.
DEU 16:10 Meenụ Mmemme Izu Ụka asaa nye Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, site na inye onyinye afọ ofufu, nʼusoro ọtụtụ ngọzị Onyenwe anyị bụ Chineke gị ji gọzie gị.
DEU 16:11 Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ nye gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, ndị ohu gị nwoke na nwanyị, ndị Livayị bi nʼobodo gị, ndị ọbịa, ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ bi nʼetiti gị. Meenụ nke a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, nʼebe ahụ ọ họpụtara dịka ebe obibi nye aha ya.
DEU 16:12 Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt, nʼihi nke a, unu echefula iwu ndị a.
DEU 16:13 Mmenụ mmemme ụlọ Ikwu. Unu aghaghị ime ya ụbọchị asaa mgbe unu wechara ihe ubi, ya bụ, mgbe unu chịkọtachara ọka site nʼebe ịzọcha ọka, nakwa ebe ịzọcha mmanya unu niile
DEU 16:14 Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ, nye gị onwe gị, ụmụ ndị ikom na ndị inyom gị, ndị odibo nwoke na nwanyị unu niile, ndị Livayị, ndị ọbịa, ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ ndị bi nʼobodo gị niile.
DEU 16:15 A ga-eme mmemme a nye Onyenwe anyị Chineke gị ụbọchị asaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị nʼonwe ya họpụtara. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi ihe ubi gị niile, gọziekwa akaọrụ gị niile, ime ka ọṅụ gị zuo oke.
DEU 16:16 Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile aghaghị ịbịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị unu, nʼebe ọ ga-ahọpụta: nʼoge mmemme ndị a: Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, Mmemme Izu Ụka asaa na Mmemme Ụlọ Ikwu. Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu Onyenwe anyị.
DEU 16:17 Onye ọbụla ga-eweta onyinye dịka o nwere ike na dịka Onyenwe anyị Chineke gị sị gọzie ya.
DEU 16:18 Ị ga-ahọpụta ndị ikpe, na ndịisi ozi nʼebo niile, na nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. Ha ga-eme ka ezi ikpe dịrị ndị mmadụ niile.
DEU 16:19 Ekpekwala ikpe aghụghọ, maọbụ kpee ikpe ile mmadụ anya nʼihu. Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka anya onye amamihe kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.
DEU 16:20 Gbasoo ikpe ziri ezi, mee ka ikpe ziri ezi dịgide, ka ị dịrị ndụ, nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
DEU 16:21 Amanyela oyiyi osisi chi Ashera ọbụla gị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ị wuru nye Onyenwe anyị Chineke gị.
DEU 16:22 Eguzokwala ogidi nkume ọbụla nʼihi na ha bụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ asị.
DEU 17:1 Achụrụla Onyenwe anyị bụ Chineke gị ehi maọbụ atụrụ nwere nkwarụ ọbụla maọbụ ntụpọ. Onyinye dị otu a bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
DEU 17:2 Ọ bụrụ na ị nụ na onye ọbụla nʼime obodo ndị ahụ Onyenwe anyị nyere gị, nwoke maọbụ nwanyị na-eme ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị ime ihe megidere ọgbụgba ndụ ya,
DEU 17:3 ọ bụrụ na onye ahụ efee chi ndị ọzọ, maọbụ kpọọ isiala nye ha, maọbụ fee anwụ, maọbụ ọnwa, maọbụ kpakpando nke mbara eluigwe bụ ihe m na-enyeghị nʼiwu,
DEU 17:4 ọ bụrụ na e mere ka ị maara nʼihe dị otu a dị maọbụ ị nụ ya, ị ghaghị ịjụ ase, nyochaa ya nke ọma. Ọ bụrụ na ihe ị nụrụ bụ eziokwu, ọ bụrụ nʼezie na e mere ihe arụ dị otu a nʼala Izrel,
DEU 17:5 kpọrọ nwoke maọbụ nwanyị ahụ mere ihe ọjọọ dị otu a, kpọpụta ya nʼọnụ ụzọ ama obodo, tụọ ya nkume, tugbuo ya.
DEU 17:6 Ma otu o si dị, a gaghị eme ka onye ahụ nwụọ site naanị nʼama otu mmadụ, kama ọ ga-anwụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara.
DEU 17:7 Ndị ahụ gbara akaebe nʼisi ya ga-eburu ụzọ tụọ ya nkume, tupu mmadụ niile esoro tugbuo ya. Site nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti gị.
DEU 17:8 Ọ bụrụ na unu enwee okwu siri ike na mkpebi, dịka igbu ọchụ, maọbụ okwu na ụka metụtara mmadụ, maọbụ ịlụ ọgụ nke mmerụ ahụ dapụtara nʼime ya, ihe unu ga-eme bụ iweta ikpe ahụ nʼebe obibi Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara,
DEU 17:9 nʼihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị na onye nọ nʼoche ikpe nʼoge ahụ ka ha gbubie ikpe ahụ.
DEU 17:10 Ị ga-emekwa dịka mkpebi ha nyere gị nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Lezie anya hụ na i mezuru ihe niile dịka ha si tụziere gị aka.
DEU 17:11 Mee dịka iwu ha ziri gị si dị, na dịka mkpebi ha nyere gị si dị. Ewezugala onwe gị site nʼokwu ha nyere gị nʼụzọ ọbụla
DEU 17:12 Ma onye ahụ ledara onye nchụaja na onye ikpe ahụ a họpụtara ije ozi nye Onyenwe anyị Chineke gị ga-anwụ. Unu ga-esi nʼala Izrel wezuga ihe ọjọọ dị otu ahụ.
DEU 17:13 Nʼụzọ dị otu a, mmadụ niile ga-anụ ihe mere onye ahụ nupuru isi, ha ga-atụ egwu ghara ịbụ ndị mpako.
DEU 17:14 Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, merie ndị bi nʼime ya, biri nʼime ya, i nwere ike malite iche nʼobi gị sị, “Anyị kwesiri inwe eze dịka mba ndị ọzọ niile dị anyị gburugburu.”
DEU 17:15 O si otu a dịrị, lezie anya hụ na onye ị ga-eme eze bụ onye ahụ Onyenwe anyị Chineke gị ga-ahọpụta. Onye ahụ aghaghị ịbụ onye Izrel nʼihi na i kwesighị ime onye mba ọzọ eze ka ọ chịa gị.
DEU 17:16 Hụ na eze ahụ ị họpụtara enweghị ọtụtụ ịnyịnya. Eze ahụ ekwesịkwaghị izipụ ndị ga-aga Ijipt ịzụpụtara ya ọtụtụ ịnyịnya ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị agwala gị sị, “Ị gaghị alaghachi Ijipt ọzọ.”
DEU 17:17 Eze ahụ agaghị enwe ọtụtụ nwunye, nʼihi na nke a ga-eme ka obi ya si nʼebe Onyenwe anyị nọ pụọ. Ọ gakwaghị ababiga ụba ọlaọcha na ọlaedo oke.
DEU 17:18 Mgbe ọ nọkwasịrị nʼocheeze dịka eze, ọ ga-esite nʼakwụkwọ iwu a ndị nchụaja bụ ndị Livayị na-edebe, depụtara onwe ya iwu a metụtara obibi ndụ ndị eze.
DEU 17:19 Ihe ahụ o depụtara ka ọ ga-agụ mgbe niile na ndụ ya. Nke a ga-eme ka ọ mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke ya, na ịgbaso ihe niile dị nʼiwu na ụkpụrụ ndị a.
DEU 17:20 Ịgụ akwụkwọ iwu a mgbe niile ga-eme ka ọ mata na o nweghị ụzọ o si dị elu karịa ụmụnna ya. Ọ ga-emekwa ka ọ ghara iwezuga onwe ya site nʼiwu a nʼụzọ ọbụla. Mgbe ahụ, ya onwe ya, na ụmụ ụmụ ya ga-achị alaeze Izrel ogologo oge.
DEU 18:1 Ndị nchụaja bụ ndị Livayị, na ndị ebo Livayị niile agaghị enwe oke maọbụ ihe nketa ọbụla dịka ebo ndị ọzọ nʼIzrel. Ihe onyinye ịchụ aja niile e wetara nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ bụ ihe nketa ha.
DEU 18:2 Ha agaghị enwe ihe nketa ọbụla nʼetiti ụmụ Izrel ndị ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị abụrụla ihe nketa nke ha dịka o kwere ha na nkwa.
DEU 18:3 Nke ga-abụ oke ruuru ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ nọ, nʼebe ndị na-achụ aja, site nʼanụ ehi maọbụ atụrụ: a ga-enye onye nchụaja ubu aka ya, agba ya abụọ na afọ ya.
DEU 18:4 Ha ga-enwetakwa mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi unu, ya bụ, ọka mbụ unu, mmanya vaịnị ọhụrụ unu, mmanụ oliv unu na ajị mbụ a kpụchapụtara site nʼahụ igwe atụrụ unu.
DEU 18:5 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ahọpụtala ebo Livayị na ụmụ ụmụ ha site nʼebo niile nke Izrel ka ha bụrụ ndị ga-eguzo jee ozi nʼihu Onyenwe anyị oge niile.
DEU 18:6 Onye Livayị ọbụla si nʼebe o bi kwapụ gaa biri nʼobodo ọzọ nʼIzrel nwere ike ije nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị họpụtara,
DEU 18:7 ọ ga-eje ozi nʼaha Onyenwe anyị bụ Chineke ya dịka ụmụnna ya ndị Livayị na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.
DEU 18:8 Ọ ga-esokwa keta oke a na-ekenye ndị Livayị bi nʼobodo ahụ, nʼagbanyeghị na ọ na-enweta ego site nʼorire e rere ihe onwunwe ezinaụlọ ya.
DEU 18:9 Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, amụtakwala ime omume arụ dịka ndị mba bi nʼala ahụ.
DEU 18:10 Ka a hapụ ịchọta onye ọbụla nʼetiti gị nke na-ewere nwa ya nwoke maọbụ nwanyị nye ka a kpọọ ya ọkụ nʼihi ịchụrụ chi ndị mba ọzọ aja. Ka onye Izrel ọbụla ghara ịbụ onye na-ajụ mmụọ ase maọbụ onye mgbaasị maọbụ na-agba aja,
DEU 18:11 maọbụ onye na-akụ mmadụ ibe ya ọgwụ, maọbụ onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa maọbụ onye na-ajụ ase site nʼaka ndị nwụrụ anwụ.
DEU 18:12 Onye ọbụla na-eme ihe ndị a bụ onye Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụkwa nʼihi ihe arụ ndị a ka Onyenwe anyị Chineke gị ji na-achụpụ ndị bi nʼala a.
DEU 18:13 Ị ghaghị ịbụ onye zuruoke nʼụzọ niile nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị.
DEU 18:14 Mba ndị ị na-aga inweta ala ha bụ ndị na-ajụ ase site nʼaka ndị mgbaasị na ndị na-agba aja, ma Onyenwe anyị Chineke gị anabataghị na ị ga-eme ihe dị otu ahụ.
DEU 18:15 Kama Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka onye amụma nke dị ka m biliere unu site nʼetiti unu, site nʼetiti ndị unu bụ Izrel. Ọ bụ ya ka unu ga-aṅa ntị.
DEU 18:16 Nʼihi na nke a bụ ihe gị onwe gị rịọrọ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼugwu Horeb, nʼụbọchị mkpokọta ahụ. I kwuru sị, “Anyị achọghị ịnụ olu Onyenwe anyị maọbụ hụ ọkụ ahụ dị egwu anya ọzọ, ka anyị ghara ịnwụ.”
DEU 18:17 Nʼihi ya, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ihe ha kwuru dị mma.
DEU 18:18 Aga m eme ka onye amụma bilie nʼetiti ha, onye Izrel dịka gị. Aga m agwa ya ihe ọ ga-ekwu, okwu niile m tinyere nʼọnụ ya ka ọ ga-agwa ha.
DEU 18:19 Onye ọbụla jụrụ ige ntị nʼokwu m niile nke onye amụma ga-agwa ha nʼaha m ka mụ onwe m ga-emesi ike.
DEU 18:20 Ma onye amụma ọbụla sitere na nganga obi ya kwuo okwu nʼaha m, bụ okwu nke m na-ezighị ya ka o kwuo, ga-anwụ, maọbụ onye amụma ọbụla nke kwuru okwu nʼaha chi ndị ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụkwa.”
DEU 18:21 I nwere ike ikwu nʼobi gị sị, “Olee otu anyị ga-esi mata na okwu e kwuru si nʼaka Onyenwe anyị nʼezie?”
DEU 18:22 Otu a ka unu ga-esi mata, ọ bụrụ na ihe onye amụma buru nʼamụma nʼaha Onyenwe anyị emezughị, okwu ahụ esighị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịa. Ọ bụ okwu onye amụma ahụ chepụtara kwuo nʼonwe ya. Unu atụla ya ụjọ.
DEU 19:1 Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị bibiri mba ndị ahụ nwe ala ahụ ọ na-enye gị, mgbe ị chụpụrụ ha bichie nʼobodo ha nakwa ụlọ ha niile,
DEU 19:2 mgbe ahụ, kewapụta obodo atọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, doo ha iche.
DEU 19:3 Kewaa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa ụzọ atọ ka otu obodo mgbaba dịrị nʼotu akụkụ. Wuzie ụzọ e si aga nʼobodo ndị a ka ọ dịrị onye na-agba ọsọ mfe ịgbaje nʼebe ahụ.
DEU 19:4 Nke a bụ iwu banyere onye ọbụla gburu mmadụ gbaba nʼebe ahụ maka izere ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ esite na-amaghị ama gbuo onye agbataobi ya, bụ onye ọ na-akpọghị asị nʼoge gara aga, ọ ga-agbaba nʼobodo ahụ nʼihi ize ndụ ya.
DEU 19:5 Ọ bụrụ na mmadụ na ibe ya agaa nʼọhịa ịwa nkụ ma isi anyụike ya esite nʼosisi ya dapụ dagbuo nwoke ahụ so ya gaa ịwa nkụ, nwoke ahụ na-awa nkụ ga-agbala nʼime otu obodo ndị a ichebe ndụ ya.
DEU 19:6 Ma ọ bụghị otu a, onye ahụ na-agba ụgwọ ọchụ ga-esite nʼọnụma juru ya obi chụọ nwoke ahụ ọsọ, chụkwute ya, gbuo ya ma ọ bụrụ na obodo mgbaba ahụ adịrị nʼebe dị anya, ọ bụ ezie na nwoke ahụ abụghị onye kwesiri ọnwụ, ebe ọ bụ na o siteghị nʼekworo gbuo onye o gburu.
DEU 19:7 Ọ bụ nke a mere m ji nye unu iwu ka unu wepụtara onwe unu obodo mgbaba atọ.
DEU 19:8 Ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka oke ala gị saa mbara dịka ọ ṅụụrụ nna nna gị ha nʼiyi na ọ ga-eme, ọ bụrụkwa na o nye gị ala niile dịka o kwere na nkwa,
DEU 19:9 nʼihi na i leziri anya gbasoo iwu ndị a m nyere gị taa ịhụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya, na ije ije dịka ụzọ ya si dị, mgbe ahụ, i nwere ike họpụta obodo atọ ọzọ, nke ga-abụ obodo izere ndụ.
DEU 19:10 Nʼụzọ dị otu a, ị ga-enwe ike gbochie ọnwụ ndị aka ha dị ọcha. Ọbara onye na-adịghị ihe o mere agaghị adịkwa gị nʼisi, nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa.
DEU 19:11 Ma ọ bụrụ na nwoke ọbụla echere onye ọ kpọrọ asị nʼụzọ, gbuo ya, mesịa gbara ọsọ gaa nʼime otu obodo ndị a,
DEU 19:12 ndị okenye obodo ya ga-ezi ndị mmadụ ka ha gaa kpụta ya site nʼebe ahụ. Ha ga-ewerekwa ya nyefee nʼaka onye ga-abọrọ onye ahụ nwụrụ anwụ ọbọ, ka o gbuo ya.
DEU 19:13 Emerela ya ebere. Ị ghaghị ikpochapụ site nʼIzrel ikpe ọmụma nke so iwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, ka ihe gaara gị nke ọma.
DEU 19:14 Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-aga inye gị dịka ihe nketa, ehigharịla oke ala onye agbataobi gị nʼala ahụ enyere gị inweta.
DEU 19:15 Amala onye ọbụla ikpe mmehie nʼihi ama otu onye gbara. E kwesiri inwe ndị akaebe abụọ, maọbụ atọ tupu a maa mmadụ ikpe.
DEU 19:16 Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imegide onye ọzọ site nʼịgba ama ụgha,
DEU 19:17 a ga-eduru mmadụ abụọ ahụ bịa nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu ndị nchụaja na ndị ikpe na-arụ ọrụ nʼoge ahụ.
DEU 19:18 Ndị ikpe ga-enyocha okwu ahụ nke ọma. Ọ bụrụ na a chọpụta na onye akaebe ahụ gbara ama ụgha,
DEU 19:19 ọ ga-ata ahụhụ ahụ nwoke ahụ ọ gbagidere akaebe gaara ata. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ndị ọjọọ site nʼetiti gị.
DEU 19:20 Ndị niile nụrụ ya ga-atụ egwu, ha agaghị emekwa ihe ọjọọ dị otu ahụ ọzọ.
DEU 19:21 Emekwala ebere ọbụla. Ndụ laara ndụ, anya laara anya, eze laara eze, aka laara aka, ụkwụ laara ụkwụ.
DEU 20:1 Mgbe i pụrụ ibuso ndị iro gị agha, ọ bụrụ na i lee anya hụ na ndị iro gị nwere ọtụtụ ịnyịnya, ụgbọ agha na ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa gị, unu atụla egwu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị, onye ahụ mere ka i si nʼala Ijipt pụta nʼudo, nọnyeere gị.
DEU 20:2 Tupu agha ebido, otu onye nchụaja ga-eguzo nʼihu ndị agha Izrel gwa ha okwu sị,
DEU 20:3 “Geenụ ntị, unu ndị Izrel, taa, unu na-apụ ibuso ndị iro unu agha. Unu atụla egwu. Unu atụla ụjọ. Ka obi unu gharakwa ịda mba.
DEU 20:4 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-eso unu gaa, ọ ga-alụrụ unu ọgụ imegide ndị iro unu, ọ ga-enyekwa unu mmeri.”
DEU 20:5 Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ga-esi otu a gwa ndị agha Izrel okwu sị ha, “O nwere onye ọbụla nʼime unu wuru ụlọ ọhụrụ ọ na-edobeghị nsọ nye Onyenwe anyị? Ka onye dị otu a laghachi nʼụlọ ya. Ka onye ahụ ghara ịnwụ nʼagha hapụ ụlọ ya, ka nwoke ọzọ doo ya nsọ nye Onyenwe anyị!
DEU 20:6 Ọ dị nwoke ọbụla kụrụ ubi vaịnị ọhụrụ nke ọ na-esitebeghị nʼime ya ghọọ mkpụrụ ọbụla? Ya laa, ka ọ ghara ịnwụ nʼagha, hapụrụ ya onye ọzọ nke ga-eri mkpụrụ si na ya!
DEU 20:7 Ọ dị nwoke nwere nwaagbọghọ o kwere nkwa na ọ ga-alụ? Ya laa, gaa lụọ nwanyị! Nʼihi na ọ bụrụ na ọ nwụọ nʼagha, nwoke ọzọ ga-alụ ya.”
DEU 20:8 Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ahụ ga-ekwukwa sị, “Ọ dị onye egwu na-atụ? Ọ bụrụ na o nwere onye ụjọ na-atụ, ya laghachi nʼụlọ ya ka ịtụ ụjọ ya hapụ ijide ndị ọzọ.”
DEU 20:9 Mgbe ndịisi agha gwachara ndị agha ha okwu ndị a, ha ga-ahọpụta ndịisi ga-achịkọta usuu ndị agha.
DEU 20:10 Mgbe ị bịaruru obodo ọbụla nso ibuso ya agha, ị ga-ebu ụzọ kpọọ ndị bi nʼime ya oku, maka ime udo.
DEU 20:11 Ọ bụrụ na ha anabata ime udo, megheere gị ọnụ ụzọ ama ha, ndị niile bi nʼime obodo ahụ ga-abụrụ gị ndị ọrụ na-agbakwara gị odibo.
DEU 20:12 Ma ọ bụrụ na ha ekweghị ime udo, lụso gị agha, mgbe ahụ, ndị agha gị ga-agba ya gburugburu.
DEU 20:13 Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị nyefere gị ya nʼaka, were mma agha gbuo nwoke ọbụla nọ nʼime ya.
DEU 20:14 Ma ụmụ nwanyị niile na ụmụntakịrị niile, anụ ụlọ niile na ihe nkwata niile nke ndị obodo ahụ ka ị ga-edebere onwe gị. Ị ga-ewerekwa ihe nkwata nke Onyenwe anyị Chineke gị nyere site nʼaka ndị iro gị mee ihe dị gị mma.
DEU 20:15 Iwu ndị a metụtara naanị mmeso ị ga-emeso obodo ndị tere anya. O metụtaghị obodo ndị na-adịghị nʼime mba ndị a dị nso.
DEU 20:16 Ma otu ọ dị, nʼobodo niile ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa, o nweghị ihe ọbụla na-eku ume ị ga-ahapụ ndụ. Laa ihe niile na-eku ume nʼiyi.
DEU 20:17 Ị ghaghị ịla obodo ndị a nʼiyi: obodo ndị Het na nke ndị Amọrait, nke ndị Kenan na nke ndị Periz, nke ndị Hiv na nke ndị Jebus, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu.
DEU 20:18 Ma ọ bụghị otu a, ha ga-akụziri gị ime ihe ndị ahụ niile rụrụ arụ ha na-eme mgbe ha na-efe chi ha dị iche iche, mee ka i mehie megide Onyenwe anyị Chineke gị.
DEU 20:19 Mgbe ị nọchibidoro obodo ọbụla ogologo oge, na-ebu agha megide ya maka iwere ya, ebibila osisi na-amị mkpụrụ dị nʼime ya site nʼiji anyụike gbutuo ha. Nʼihi na i nwere ike rie mkpụrụ osisi ha, egbutula ha. Osisi dị nʼọhịa ha ọ bụ ndị mmadụ, na ị ga-anọchibido ha?
DEU 20:20 Naanị osisi na-adịghị amị mkpụrụ ka ị ga-egbutu, nke a na-adịghị eri mkpụrụ ya eri. Jiri ha meere onwe gị ngwa ọgụ, dịka ubibi, na nkwasa, na ihe unu ji etitu mgbidi obodo ahụ.
DEU 21:1 Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, biri nʼime ya, ọ bụrụ na ị hụ otu onye e gburu egbu ka ọ tọgbọ nʼime ọhịa, ma ị maghị onye gburu ya,
DEU 21:2 ndị okenye gị, na ndị ikpe ga-apụta, tụọ ịdị anya nke obodo niile dị gburugburu ọhịa ahụ, site nʼebe ahụ onye ahụ e gburu egbu tọgbọ.
DEU 21:3 Ndị okenye obodo ahụ ga-ewere nwa nne ehi a na-ejibeghị rụọ ọrụ, maọbụ nyara yoku ọbụla
DEU 21:4 ha ga-eduru ya gaa na ndagwurugwu nke mmiri na-eru nʼime ya, ndagwurugwu a na-egwuzebeghị mgbe ọbụla ịrụ ọrụ ubi nʼime ya, nke a na-akụghị mkpụrụ nʼime ya, gbajie olu nwaagbọghọ ehi ahụ nʼebe ahụ.
DEU 21:5 Ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ga-abịa, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ahọpụtala ha ka ha bụrụ ndị na-ejere ya ozi. Ha ka ọ họpụtakwara ikwupụta ngọzị nʼaha Onyenwe anyị, na ikpe niile metụtara mmerụ ahụ.
DEU 21:6 Mgbe ahụ, ndị okenye niile nke obodo ndị ahụ dịkarịsịrị ozu ahụ nso, ga-akwọ aka ha nʼelu nwaagbọghọ ehi ahụ, nke ahụ a gbajiri olu nʼime ndagwurugwu ahụ.
DEU 21:7 Ha ga-ekwupụta sị, “Aka anyị dị ọcha, ọ bụghị anyị gburu nwoke a, anyị amakwaghị onye gburu ya.
DEU 21:8 Onyenwe anyị, kpuchiere ndị gị Izrel mmehie ha, bụ ndị gị ị gbapụtara. Agụla ndị gị dịka ndị ikpe mara nʼihi ọnwụ nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ.” Otu a ka a ga-esi kpuchie mmehie nʼihi mwụfu ọbara ahụ.
DEU 21:9 Nʼụzọ dị otu a, ka ị ga-esi wezugara onwe gị ikpe ọmụma gaara abụ nke gị nʼihi ọbara onye ahụ nwụrụ anwụ, ebe ọ bụ na i meela ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
DEU 21:10 Mgbe ị pụrụ ibuso ndị iro gị agha, ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka i merie ndị iro gị, dọta ụfọdụ nʼime ha nʼagha,
DEU 21:11 ọ bụrụ na ị hụ nwaagbọghọ mara mma nke masịrị gị nʼetiti ndị a dọtara nʼagha, i nwere ike iduru ya ka ọ bụrụ nwunye gị.
DEU 21:12 Ị ga-akpọbata ya nʼụlọ gị, mee ka ọ kpụcha agịrị isi ya, bekwaa mbọ ya niile,
DEU 21:13 yipụ uwe ahụ o yi mgbe e jidere ya. Ọ ga-anọdụ nʼụlọ gị ruo ụjụ nʼihi nna ya na nne ya otu ọnwa. Emesịa, i nwere ike ịbakwuru ya ghọọ di ya, ya onwe ya ga-aghọkwa nwunye gị.
DEU 21:14 Ọ bụrụ na ihe ya amasịkwaghị gị, ị ga-ahapụ ya ka ọ gaa ebe ọbụla ọ chọrọ. Ị gaghị ere ya nʼọnụ ego ọbụla maọbụ kpasi ya agwa dịka ohu, ebe ọ bụ na ị wedala ya nʼala site nʼịhụ ọtọ ya anya.
DEU 21:15 Ọ bụrụ na nwoke lụrụ ndị inyom abụọ, ma hụ otu nʼime ha nʼanya karịa nke ọzọ, ọ bụrụkwa na ndị inyom abụọ ahụ mụtaara ya ụmụ ndị ikom, ma nwanyị ahụ ọ kpọrọ asị buuru ụzọ mụta nwa nwoke,
DEU 21:16 mgbe nwoke ahụ na-eke ihe onwunwe ya, ọ gaghị ewere oke ruuru ọkpara ya, nke nwanyị ahụ ọ kpọrọ asị mụtara kenye nwa nwoke nke nwanyị ahụ ọ hụrụ nʼanya mụrụ.
DEU 21:17 Ọ ga-anabata nwa nwoke nke nwanyị ahụ ọ na-ahụghị nʼanya mụtara dị ka ọkpara, nye ya, oke abụọ site nʼihe niile o nwere. Nʼihi na nwoke ahụ bụ mmalite ume ya, ọnọdụ nke ị bụ ọkpara bụkwa nke ya.
DEU 21:18 Ọ bụrụ na nwoke amụta nwa nwoke na-eme isiike, nke na-enupu isi, onye na-adịghị ege nna ya na nne ya ntị, ọ bụladị mgbe ha dọrọ ya aka na ntị.
DEU 21:19 Nne ya na nna ya ga-eduru ya gaa nʼihu ndị okenye, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha.
DEU 21:20 Ha ga-agwa ndị okenye obodo ahụ, “Nwa anyị nwoke a na-eme isiike, na-enupu isi, ọ dịghị ege ntị nʼolu anyị. Ọ bụ onye mmefu na onye na-aṅụbiga mmanya oke.”
DEU 21:21 Ndị ikom niile nke obodo ahụ ga-ewere nkume tugbuo ya. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ ahụ nʼetiti unu. Ndị Izrel niile ga-anụ ihe mere, ụjọ ga-atụkwa ha.
DEU 21:22 Ọ bụrụ na nwoke ọbụla emee ihe ọjọọ kwesiri ọnwụ, ọ bụrụ na e kpee ya ikpe ọnwụ, kwụgbuo ya nʼosisi,
DEU 21:23 unu agaghị ahapụ ozu ya ka ọ dịgide nʼelu osisi abalị ahụ niile. Hụnụ na e liri ya nʼotu ụbọchị ahụ, nʼihi na onye ọbụla a kwụbara nʼelu osisi bụ onye Chineke bụrụ ọnụ. Emerụla ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa.
DEU 22:1 Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ atụrụ nwanna gị ka ọ na-akpafu, emela dịka a ga-asị na ị hụghị ya, jide ya, kpụlaara ya onye nwe ya.
DEU 22:2 Ọ bụrụ na ị maghị onye nwe ya, maọbụ na nwanna gị ebighị nso, were ya laa nʼụlọ gị, hapụ ya nʼebe ahụ tutu onye nwe ya achọwa ya, mgbe ahụ ka ị ga-ewere ya nyeghachi ya.
DEU 22:3 Otu a kwa ka ị ga-eme ma ị hụ ịnyịnya ibu nwanna gị, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla ị ga-atụtụta. Were ya debere onye nwe ya.
DEU 22:4 Ọ bụrụ na ị hụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi nwanna gị ka ha dara nʼụzọ, elela anya nʼebe ọzọ, gaa nyere ya aka bulie ya.
DEU 22:5 Nwanyị ekwesighị iyi uwe ndị ikom, nwoke agaghị eyikwa uwe ndị inyom. Nʼihi na ihe arụ ka ọ bụ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.
DEU 22:6 Ọ bụrụ na ị hụ akwụ nnụnụ tọgbọ nʼala, maọbụ nke dị nʼelu osisi, ọ bụrụkwa na ọ bụ nnụnụ nke nọ nʼelu ụmụ ya, maọbụ nʼelu akwa ya, ewerela nne na ụmụ nnụnụ ya.
DEU 22:7 Hapụ nne nnụnụ ka ọ laa, ma were naanị ụmụ ya. Ihe ga-agakwara gị nke ọma nʼihi ya, ị ga-enwekwa ndụ ogologo.
DEU 22:8 Mgbe i wuru ụlọ, wuokwa ihe mgbochi gburugburu elu ya, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara isi nʼelu ya dapụ, si otu a wetara ụlọ na onye nwe ya ikpe ọmụma nke iwufu ọbara.
DEU 22:9 Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi vaịnị gị. Ọ bụrụ na i mee otu a, ihe ọkụkụ ndị a, na mkpụrụ ha mịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ.
DEU 22:10 Ejikọla ehi na ịnyịnya ibu maka ịdọ ihe e ji akọ ala ubi.
DEU 22:11 Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ kpaa, dịka uwe ajị anụ na ogho ọcha kpaa.
DEU 22:12 Ị ga-akpanyere onwe gị ihe ogho akpara akpa, nʼakụkụ anọ nke uwe mgbokwasị gị.
DEU 22:13 Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaagbọghọ, mesie mgbe o dinakwuru ya kpebie nʼobi ya na ọ chọkwaghị ịlụ ya ọzọ,
DEU 22:14 ọ bụrụ na nwoke a ekwutọọ nwaagbọghọ ahụ, mebie aha ya kwuo na nwaagbọghọ ahụ amatalarị nwoke tupu ha abụọ alụọ,
DEU 22:15 nne nwaagbọghọ ahụ, na nna ya, ga-ewere ihe ga-egosi na nwa ha amabeghị nwoke gaa nʼihu ndị okenye obodo ahụ, nʼọnụ ụzọ ama.
DEU 22:16 Nna nwaagbọghọ ahụ ga-agwa ndị okenye, “Enyere m nwoke a nwa m nwanyị dịka nwunye, ma ugbu a, ọ chọkwaghị ịlụ ya.
DEU 22:17 Ugbu a, o boola ya ebubo ihere, sị, ‘Achọpụtaghị m ihe ọbụla nʼahụ nwa gị nwanyị a ihe na-egosi na ọ maghị nwoke.’ Ma nke a bụ ihe ngosi na ada anyị amaghị nwoke.” Mgbe ahụ ndị mụrụ ya ga-agbasapụ akwa ahụ nʼihu ndị okenye obodo ahụ.
DEU 22:18 Ndị okenye obodo ahụ ga-akpọrọ nwoke nyekwa ya ahụhụ.
DEU 22:19 Ha ga-emekwa ya ka ọ kwụọ nna nwaagbọghọ ahụ narị shekel ọlaọcha, nʼihi na o boro nwaagbọghọ Izrel na-amaghị nwoke ebubo ụgha. Nwaagbọghọ ahụ ga-anọgide bụrụ nwunye nwoke ahụ. Nwoke ahụ agaghị achụpụkwa ya ụbọchị ndụ ya niile.
DEU 22:20 Ma ọ bụrụ na ebubo nwoke ahụ bụ eziokwu, na achọpụtaghị ihe gosiri na nwaagbọghọ ahụ amaghị nwoke.
DEU 22:21 A ga-eduru nwaagbọghọ ahụ pụta nʼọnụ ụzọ ụlọ nna ya, nʼebe ahụ ka ndị ikom obodo ya ga-anọ were nkume tugbuo ya. Nʼihi na o mere ihe ihere jọgburu onwe ya nʼIzrel, site nʼibi ndụ akwụna mgbe ọ ka nọ nʼụlọ nne ya na nna ya. Ị ghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ ahụ site nʼetiti unu.
DEU 22:22 Ọ bụrụ na e jide nwoke ebe ya na nwunye onye ọzọ dina, ma nwoke ahụ dinara ya ma nwanyị ahụ o dinara aghaghị ịnwụ. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.
DEU 22:23 Ma ọ bụrụ na nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ na nwoke ọzọ edinakọọ nʼime obodo,
DEU 22:24 ya na nwoke ahụ ka a ga-eduru gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo, were nkume tugbuo ha nʼebe ahụ, ka ha nwụọ, nwaagbọghọ ahụ ga-anwụ nʼihi na o tighị mkpu, ma nwoke ahụ ga-anwụ nʼihi na o mebiela nwunye nwoke ibe ya na-achọ ịlụ. Unu aghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti unu.
DEU 22:25 Ma ọ bụrụ na nwoke ezute nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ nʼọhịa, were ike mee ka ha abụọ dina, ọ bụ naanị nwoke ahụ ga-anwụ.
DEU 22:26 Aka nwaagbọghọ ahụ dị ọcha, ọ dịghị mmehie o mere nke ikpe ọnwụ ji adịrị ya, nʼihi na ọnọdụ ya dị ka ọnọdụ mmadụ ahụ onye iro ya bịakwasịrị na mberede gbuo ya.
DEU 22:27 A pụrụ ị sị na nwaagbọghọ ahụ tiri mkpu ma ọ dịghị onye nọ ịnapụta ya.
DEU 22:28 Ọ bụrụ na nwoke ọbụla ejiri ike jide nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke nwoke ọbụla na-ekwebeghị nkwa ịlụ, mee ka ha abụọ dinaa,
DEU 22:29 nwoke ahụ ga-akwụ nna nwaagbọghọ ahụ iri shekel ọlaọcha ise. Ọ ga-alụkwa nwaagbọghọ ahụ nʼihi na o mebiela ya. Ọ gakwaghị achụpụ ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
DEU 22:30 Nwoke ọbụla agaghị alụ nwunye nna ya, nʼihi na ọ bụ nwunye nna ya. Ime ihe dị otu a bụ imerụ ihe ndina nna ya.
DEU 23:1 Nwoke ọbụla echipịara mkpụrụ amụ ya, maọbụ nke e bipụrụ mkpụrụ amụ ya, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị.
DEU 23:2 Nwa ọbụla a mụtara site nʼịkwa iko agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ụmụ ụmụ ya, ruo nʼọgbọ nke iri, agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị.
DEU 23:3 Onye Amọn, maọbụ onye Moab, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke iri ha.
DEU 23:4 Nʼihi na ha e jighị achịcha na mmiri bịa zute unu nʼụzọ mgbe unu si Ijipt pụta, ha goro Belam, nwa Beoa, onye si Petọ nke dị na Aram Naharaim, ka ọ bụọ unu ọnụ.
DEU 23:5 Ma Onyenwe anyị Chineke gị egeghị Belam ntị, kama Onyenwe anyị Chineke gị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọrọ gị ngọzị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị hụrụ gị nʼanya.
DEU 23:6 Achọla udo ndị Amọn na Moab, na ọdịmma ha ụbọchị ndụ gị niile ruo mgbe ebighị ebi.
DEU 23:7 Ma eledala ndị Edọm anya, nʼihi na ndị Edọm bụ ụmụnna unu. Unu eledala ndị Ijipt anya, nʼihi na unu biri dịka ndị ọbịa nʼime ala ha.
DEU 23:8 Ụmụ a ga-amụrụ ha nʼọgbọ nke atọ ha nwere ike ịbata na mkpọkọta nke Onyenwe anyị.
DEU 23:9 Mgbe unu mara ụlọ ikwu unu maka ibu agha megide ndị iro unu, wezuganụ onwe unu site nʼihe ọbụla na-adịghị ọcha.
DEU 23:10 Nwoke ọbụla nʼetiti gị nke na-adịghị ọcha site nʼịnyụ mkpụrụ nwa nʼahụ ya nʼabalị, ga-apụ gaa nọdụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
DEU 23:11 Ọ ga-anọ nʼebe ahụ ruo uhuruchi, emesịa, ọ ga-asa ahụ ya lọghachi nʼụlọ ikwu nʼanyasị.
DEU 23:12 Ị ga-enwekwa otu ebe ndị gị ga-anọ jee nʼogwe ga-adị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
DEU 23:13 Onye ọbụla nʼime unu ga-enwe shọvel dịka otu nʼime ngwa agha ya. Mgbe ọbụla kwa o jere nʼogwe, ọ ga-eji ya gwuo ala kpochie nsị ọ nyụrụ.
DEU 23:14 Ụlọ ikwu gị ga-adị nsọ, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị na-ejegharị nʼetiti gị ichebe gị, na ịnapụta gị site nʼaka ndị iro gị. Onyenwe anyị achọghị ihu ihe ọbụla na-adịghị mma nʼanya, ka ọ ghara ịlaghachi azụ iso gị.
DEU 23:15 Ọ bụrụ na ohu esite nʼaka onye nwe ya gbakwute unu, akwagidela ya ka ọ lọghachi,
DEU 23:16 hapụ ya ka o biri nʼetiti gị nʼime obodo ọbụla masịrị ya, emegbukwala ya.
DEU 23:17 Ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị, onye Izrel ga-aghọ akwụna ụlọ arụsị.
DEU 23:18 Ị gaghị ewebata nʼụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, onyinye ọbụla site nʼego nwanyị na-agba akwụna kpatara, maọbụ site nʼego nwoke ahụ na-edebe onwe ya dịka akwụna nye ndị ikom ibe ya kpatara, iji mezuo nkwa ọbụla. Nʼihi na ha abụọ bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.
DEU 23:19 A nakwala onye Izrel ibe gị ọmụrụnwa, nʼihe ọbụla i binyere ya, maọbụ ego, maọbụ nri, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ nwere ike ịmụta ọmụrụnwa.
DEU 23:20 Onye mba ọzọ ka ị ga-ana ọmụrụnwa nʼihe i binyere ya, ọ bụghị onye Izrel ibe gị. Ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼihe niile i tinyere aka gị ime nʼala ahụ nke ị na-aba inweta.
DEU 23:21 Mgbe i kwere Onyenwe anyị bụ Chineke gị nkwa, alala azụ nʼịkwụghachi ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị chọrọ ka ị kwụghachi nkwa gị ọsịịsọ. Ọ ga-abụkwara gị mmehie ma i meghị ya.
DEU 23:22 Ma ọ gaghị abụrụ gị mmehie ma ọ bụrụ na i kweghị nkwa ọbụla!
DEU 23:23 Ihe ọbụla nke i kwere na nkwa, jisie ike hụ na i mezuru nke ahụ dịka okwu gị si dị, nʼihi na ọ bụ onyinye afọ ofufu nye Onyenwe anyị Chineke gị.
DEU 23:24 Ọ bụrụ na ị banye nʼubi vaịnị onye agbataobi gị, i nwere ike ghọrọ mkpụrụ vaịnị ọbụla ị chọrọ rachaa nʼebe ahụ, ma etinyela mkpụrụ ọbụla nʼakpa gị.
DEU 23:25 Otu a kwa, ị banye nʼubi ọka onye agbataobi gị, ghọrọ mkpụrụ ọka ọbụla ị chọrọ nʼaka gị, nọọkwa nʼebe ahụ taa ya, ma ị gaghị etinye mma iwe ihe ubi nʼime ọka ha ndị guzoro eguzo.
DEU 24:1 Ọ bụrụ na nwoke akpọrọ nwanyị, lụọ ya, ma emesịa ihe nwanyị ahụ amasịkwaghị ya nʼihi na ọ dị ihe ọ chọpụtara nʼahụ ya nke na-adịghị mma, ọ ga-ede akwụkwọ alụkwaghị m nye nwanyị ahụ nʼaka, zilaa ya.
DEU 24:2 Ọ bụrụ na emesịa, nwoke ọzọ alụọ ya,
DEU 24:3 ma nwoke ahụ ekpebiekwa ịgbara ya akwụkwọ achọkwaghị m, maọbụ na nwoke a mesịrị nwụọ,
DEU 24:4 nwoke mbụ ahụ lụrụ nwanyị ahụ agaghị alụ ya ọzọ, nʼihi na nwanyị a abụrụla onye rụrụ arụ nye nwoke ahụ. Ọ bụkwa arụ nʼanya Onyenwe anyị ma di ya nke mbụ lụọ ya ọzọ. Ihe dị otu a ga-eweta ihe ọjọọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa.
DEU 24:5 Nwoke ọbụla lụrụ nwunye ọhụrụ agaghị apụ soro ndị agha, maọbụ soro rụọ ọrụ ọzọ pụrụ iche, otu afọ ka ọ ga-enwere onwe ya ịnọ nʼụlọ ya, ya na nwunye ya, ime onwe ha obi ụtọ.
DEU 24:6 Mmadụ agaghị ewere nkume ịkwọ nri dịka ihe ebe, nʼihi na ọ bụ ihe onye nwe ya ji achọta nri ụbọchị ya.
DEU 24:7 Ọ bụrụ na onye ọbụla ezuru nwanna ya onye Izrel nʼohi, mesoo ya mmeso dịka ohu, maọbụ ree ya, onye ohi ahụ ga-anwụ. Nke a bụ ikpochapụ ihe ọjọọ nʼetiti gị.
DEU 24:8 Gbalịsie ike ịhụ na ị na-eso iwu niile onye nchụaja, bụ onye Livayị nyere gị banyere ndị nwere ọrịa ekpenta, nʼihi na agwala m ya usoro ha ga-agbaso.
DEU 24:9 Chetakwa ihe Onyenwe anyị Chineke gị mere Miriam, mgbe i si nʼIjipt na-apụta.
DEU 24:10 Ọ bụrụ na i binye mmadụ ihe ọbụla, abanyekwala nʼụlọ ya ịnata ihe a na-enye gị dị ka ihe ebe.
DEU 24:11 Guzo nʼezi! Ka onye ahụ ị na-ebinye ihe wetara gị ihe ibe ahụ nʼezi.
DEU 24:12 Ọ bụrụ na ọ bụ onye ogbenye na-enweghị ihe, e jidela ihe ibe ya naba ụra abalị.
DEU 24:13 Weghachiri ya akwa ahụ nʼanyasị, ka onye agbataobi gị jiri ya hie ụra abalị. Mgbe ahụ ha ga-ekele gị, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agụkwara gị ya nʼezi omume.
DEU 24:14 Emegbula nwa ogbenye mkpa na-akpa i goro ọrụ, ma onye ahụ ọ bụ nwa Izrel ma ọ bụkwanụ onye ọbịa bi nʼobodo gị.
DEU 24:15 Kwụọ ya ụgwọ ya ụbọchị niile tupu anwụ adaa, nʼihi na ebe ọ bụ nwa ogbenye, obi ya dabeere nʼụgwọ ahụ ị ga-akwụ ya. Ọ bụrụ na i meghị otu a, ọ ga-akwa akwa kpọkuo Onyenwe anyị megide gị. A ga-agụkwara gị ya dịka mmehie.
DEU 24:16 Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.
DEU 24:17 Ikpe ziri ezi ga-adịrị, ọ bụladị onye ọbịa na nwa mgbei, anarakwala nwanyị di ya nwụrụ anwụ uwe ya dịka ihe ibe.
DEU 24:18 Cheta mgbe niile na i bụrụrị ohu nʼala Ijipt, ma Onyenwe anyị Chineke gị gbapụtara gị, nʼihi nke a ka m ji enye gị iwu ndị a.
DEU 24:19 Ọ bụrụ na i lefuo ukwu ọka ụfọdụ anya mgbe ị na-ewe ihe ubi nʼubi gị, alaghachila azụ nʼubi gị ịchịrị ha. Hapụrụ ya ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị, ọ ga-emekwa ka ị baa ụba.
DEU 24:20 Mgbe ị na-akụtusi mkpụrụ osisi oliv gị, ejeghachila azụ nʼalaka ọbụla inyochazi ya, ịchọpụta ma ị ghọtachaala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ha. Hapụrụ ndị ọbịa na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ mkpụrụ ọbụla fọdụrụ.
DEU 24:21 Otu a ka ị ga-emekwa nʼihe banyere mkpụrụ ubi vaịnị gị. Atụtụkọchala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ya. Hapụrụ ndị ọbịa, na ndị mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ ihe niile fọdụrụ.
DEU 24:22 Chetakwa na o nwere mgbe ị bụ ndị ohu nʼala Ijipt. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a.
DEU 25:1 Mgbe esemokwu dị nʼetiti ndị mmadụ, ha ga-ebuga ikpe ha nʼụlọikpe ebe ndị ikpe ga-elenye anya nʼikpe ahụ, maa onye ajọ omume ikpe, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya.
DEU 25:2 Ọ bụrụkwa na onye ikpe mara kwesiri ka apịa ya ụtarị, onye ọkaikpe ga-eme ka onye ahụ dinaa ala nʼihu ya, ka apịakwa ya ọnụọgụgụ ụtarị kwesiri ajọ omume ya,
DEU 25:3 ma agaghị eti ya karịa ọnụ ụtarị iri anọ. Ọ bụrụ na e tie onye ahụ ikpe mara ọnụ ụtarị karịrị nke a, ọ ga-abụ onye e leliri anya nʼihu ndị Izrel ibe ya.
DEU 25:4 Mgbe ehi na-azọcha ọka, ejila ihe kechie ya ọnụ.
DEU 25:5 Ọ bụrụ na nwoke anwụọ na-amụtaghị nwa, nwunye ya ahụ agaghị alụ di nʼama, kama nwanne nwoke di ya ga-alụrụ ya, ha ga-edinakọkwa.
DEU 25:6 Nwa nwoke mbụ nwanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ, ka a ghara ihichapụ aha ya nʼala Izrel.
DEU 25:7 Ma ọ bụrụ na nwoke ahụ ajụ ịlụ nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ, nwanyị ahụ ga-ejekwuru ndị okenye obodo ahụ nʼọnụ ụzọ ama, gwa ha sị, “Nwanne di m ajụla ime ka aha nwanne ya nwoke dịgide nʼIzrel. O kweghị ịrụ ọrụ kwesiri nwanne di nʼebe m nọ.”
DEU 25:8 Ndị okenye obodo ga-akpọ ya, dụọ ya ọdụ. Ọ bụrụ na ọ nọgide jụ sị, “Achọghị m ịlụ ya,”
DEU 25:9 nwanyị ahụ ga-ejekwuru ya nʼihu ndị okenye, tọpụ akpụkpọụkwụ o yi nʼụkwụ aka nri ya, bụọ ya asụ nʼihu, sị ya, “Otu a ka a na-eme nwoke ọbụla jụrụ iwuli ụlọ nwanne ya nwoke.”
DEU 25:10 A ga-ama ahịrị ya nʼIzrel dịka, “Ezinaụlọ nwoke ahụ e sitere nʼụkwụ ya yipụ akpụkpọụkwụ ya.”
DEU 25:11 Mgbe ndị ikom abụọ na-alụ ọgụ, ọ bụrụ na nwunye otu nʼime ha abịa ịnapụta di ya site nʼaka onye na-eti ya ihe, ma nwanyị ahụ esetipụ aka jide nwoke ahụ nʼamụ ya,
DEU 25:12 a ga-egbupụ aka nwanyị ahụ. Ebere adịghị ya.
DEU 25:13 Enwela ụzọ ihe ọtụtụ abụọ nʼime akpa gị, nke dị arọ, na nke na-adịghị arọ.
DEU 25:14 Enwela ụdị ihe ọtụtụ abụọ nʼụlọ gị, nke ukwu na nke nta.
DEU 25:15 Ị ghaghị inwe ezi ihe ọtụtụ na nke zuru ezu. Nke a ga-eme ka ndụ gị dị ogologo, dịkwa mma nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
DEU 25:16 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ onye ọbụla na-eme ihe ndị a asị, bụ onye ọbụla na-aghọ aghụghọ.
DEU 25:17 Cheta ihe ndị Amalek mere gị nʼụzọ mgbe i si nʼIjipt na-apụta.
DEU 25:18 Chetakwa na ha lụsoro gị ọgụ mgbe ike gwụrụ gị, mgbe ị dara mba, tigbuo ndị niile ji nwayọọ na-abịa nʼazụ. Ha atụkwaghị egwu Chineke.
DEU 25:19 Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị mere ka i nwere onwe gị site nʼaka ndị iro gbara gị gburugburu, mgbe o mere ka i zuru ike nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa, ime ka i nweta ya, ị ghaghị igbuchapụ ndị Amalek, ka ha bụrụ ndị a na-agaghị echetakwa ọzọ nʼokpuru eluigwe. Echefukwala ime otu a.
DEU 26:1 Mgbe ị ga-aba nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa, mgbe ị nwetara ya, birikwa nʼime ya,
DEU 26:2 ị ga-ewere ụfọdụ nʼime mkpụrụ niile si nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, tinye ya nʼime nkata, were ya gaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, dịka ebe a kpọkwasịrị aha ya.
DEU 26:3 Ị ga-agwakwa onye nchụaja nọ nʼọrụ nʼoge ahụ okwu sị: “Ana m ekwupụta taa nye Onyenwe anyị Chineke gị na abịala m nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụụrụ nna nna anyị ha nʼiyi inye anyị.”
DEU 26:4 Onye nchụaja ahụ ga-anara nkata ahụ, dọba ya nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị.
DEU 26:5 Mgbe ahụ, ị ga-ekwupụta nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị sị, “Nna nna m bụ onye Aram na-awagharị awagharị, onye jere Ijipt izere ndụ. Ha dị ole na ole mgbe ha gara Ijipt, ma nʼIjipt ha ghọrọ mba dị ukwuu, ndị dị ike, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ.
DEU 26:6 Ma ndị Ijipt mejọrọ anyị, mee ka anyị taa ahụhụ nʼihi ọrụ dị ike nke ha bokwasịrị anyị.
DEU 26:7 Mgbe ahụ, anyị tikuru Onyenwe anyị Chineke nna nna anyị. Onyenwe anyị nụrụ olu anyị, hụkwa mmegbu a na-emegbu anyị, na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ, na ọnọdụ ọjọọ anyị.
DEU 26:8 Onyenwe anyị ji aka dị ike na ogwe aka o setịrị eseti, nʼọtụtụ ihe oke egwu na ọrụ ịrịbama, na ihe ebube, si nʼIjipt kpọpụta anyị.
DEU 26:9 Ọ kpọbatara anyị nʼebe a, nye anyị ala a, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
DEU 26:10 Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị, lee, ewebatala m mkpụrụ mbụ sitere nʼala i nyere m.” Dọba nkata ahụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, kpọọkwa isiala nye ya nʼebe ahụ.
DEU 26:11 Mgbe ahụ, gị na ndị Livayị, na ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, ga-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọma niile Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị na ezinaụlọ gị.
DEU 26:12 Nʼafọ nke atọ ọbụla, ị ga-enye onyinye pụrụ iche, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri, nke ihe ubi gị. Nʼafọ ahụ, ị ga-enye ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri gị, ka ha rie ya nʼobodo gị dị iche iche, ka afọ jukwa ha.
DEU 26:13 Ị ga-ekwupụta nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị sị, “Esitela m nʼụlọ wepụ oke ahụ dị nsọ, nye ha ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, dịka i nyere m nʼiwu, enupughị m isi maọbụ chefuo iwu gị ọbụla.
DEU 26:14 Erighị m ihe ọbụla si nʼime ya mgbe m na-eru ụjụ maọbụ wepụ ihe ọbụla nʼime ya nʼọnọdụ adịghị ọcha m, ọ dịkwaghị nke m ji chụọrọ ndị nwụrụ anwụ aja. Egeela m ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke m, meekwa ihe niile i nyere m nʼiwu.
DEU 26:15 Site nʼebe obibi nsọ gị dị nʼeluigwe ledata anya gị, gọzie ndị gị Izrel na ala a i nyere anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, dịka i kwere nna nna anyị ha na nkwa.”
DEU 26:16 Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị iwu taa si gị gbaso ụkpụrụ ndị a na iwu ndị a. Lezie anya hụ na i ji obi gị niile na mkpụrụobi gị niile debe ha.
DEU 26:17 I kwupụtala taa na Onyenwe anyị bụ Chineke gị, i kweekwala nkwa na ị ga-ege ya ntị, debe iwu ya niile, na ụkpụrụ ya niile, na ị ga-emekwa ihe niile ọ sị gị mee.
DEU 26:18 Taa kwa, Onyenwe anyị ekwupụtala na unu bụ ndị nke aka ya, dịka o kwere na nkwa, na ị ga-edebekwa ihe niile o nyere nʼiwu.
DEU 26:19 O kwuru na ọ ga-emekwa ka i karịa mba niile o kere elu, nʼotuto, nʼaha, nsọpụrụ na ịja mma. Na unu ga-abụkwa mba dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke unu, dịka o kwere na nkwa.
DEU 27:1 Mosis na ndị okenye Izrel nyere ndị Izrel iwu sị, “Debenụ iwu ndị a niile m na-enye unu taa.
DEU 27:2 Mgbe ị gabigara osimiri Jọdan ruo nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, bukọtaanụ nkume buru ibu nʼotu ebe, jirikwa ụrọ ọcha techie ha.
DEU 27:3 Depụta nʼelu nkume ndị ahụ iwu na ụkpụrụ ndị a mgbe ị batara nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, nke Onyenwe anyị Chineke nna nna gị kwere nkwa inye gị.
DEU 27:4 Mgbe ị nọkwa nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, doo nkume ukwu ndị a nʼugwu Ebal, dịka m na-enye gị nʼiwu taa. Jirikwa ụrọ ọcha techie ha.
DEU 27:5 Wuokwara Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ya nʼebe ahụ. Ebe ịchụ aja eji naanị nkume wuo, nke ejighị ihe ngwa ọrụ igwe rụọ ihe bụla na ya.
DEU 27:6 Jiri nkume a na-awaghị awa wuore Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ahụ, chụọkwa aja nʼelu ya nye Onyenwe anyị Chineke gị.
DEU 27:7 Chụọ aja udo nʼebe ahụ, rie ha, ma ṅụrịakwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị.
DEU 27:8 Depụta iwu ndị a nke ọma, nʼelu nkume ndị ahụ i guzobere.”
DEU 27:9 Mgbe ahụ, Mosis na ndị nchụaja, bụ ndị Livayị, gwakwara ndị Izrel niile okwu sị, “Nọọnụ jii, gị Izrel, gekwaa ntị! Taa, ị ghọọla ndị nke Onyenwe anyị Chineke unu.
DEU 27:10 Nʼihi ya debe iwu niile Onyenwe anyị Chineke gị na ụkpụrụ niile ndị m nyere gị taa.”
DEU 27:11 Nʼotu ụbọchị ahụ ka Mosis nyere ha iwu sị,
DEU 27:12 Mgbe unu gafere Jọdan, ebo ndị a: Simiọn, na Livayị na Juda na Isaka na Josef na Benjamin, ga-eguzo nʼelu ugwu Gerizim gọzie ụmụ Izrel
DEU 27:13 Agbụrụ Ruben, Gad, Asha, Zebụlọn, Dan na Naftalị ga-eguzo nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ.
DEU 27:14 Ndị Livayị ga-eji olu dị elu gụpụta ya nye ụmụ Izrel niile,
DEU 27:15 “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-apị arụsị maọbụ oyiyi ọbụla, akaọrụ onye ǹka, nke bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma na-eguzobe ya na nzuzo.” Ndị mmadụ niile ga-aza sị, “Amen.”
DEU 27:16 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-elelị nna ya na nne ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
DEU 27:17 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-ehigharị oke ala onye agbataobi ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
DEU 27:18 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-eduhie onye ìsì ụzọ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
DEU 27:19 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
DEU 27:20 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-abakwuru nwunye nna ya soro ya dinaa, nʼihi na o merụọla ihe ndina nna ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
DEU 27:21 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
DEU 27:22 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nwanne ya nwanyị na-akwa iko, bụ nwanne ya nke nne ya mụrụ, maọbụ nke nwunye nna ya mụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
DEU 27:23 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
DEU 27:24 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-etigbu mmadụ ibe ya na nzuzo.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
DEU 27:25 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-anara ngarị maka itigbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
DEU 27:26 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-adịghị eme ka iwu ndị a guzosie ike site na-edebeghị ha.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
DEU 28:1 Ọ bụrụ na i debezuo ma gbasookwa iwu ndị a niile Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼaka m na-enye gị taa, Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka ị ghọọ mba kachasị mba niile nʼụwa elu.
DEU 28:2 Ngọzị ndị a niile ga-abịakwasị gị, zuo gị ahụ, ma ọ bụrụ na i rubere Onyenwe anyị Chineke gị isi.
DEU 28:3 Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ nʼobodo, bụrụkwa onye a gọziri agọzi nʼala ubi.
DEU 28:4 Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ na mkpụrụ nke ala ubi gị na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, ụmụ ehi gị mụrụ na ụmụ igwe ewu na atụrụ gị.
DEU 28:5 Ihe a gọziri agọzi ka abọ gị na ihe i ji agwọ achịcha ga-abụ.
DEU 28:6 Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata na mgbe ị na-apụ apụ.
DEU 28:7 Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro ọbụla buliri onwe ha elu imegide gị bụrụ ndị e meriri nʼihu anya gị. Ha ga-esite nʼotu ụzọ buso gị agha, ma ha ga-esite nʼụzọ asaa si nʼihu gị gbalaga.
DEU 28:8 Onyenwe anyị ga-ezipụ ngọzị ya ka ọ dịkwasị nʼelu ọba gị na nʼelu ihe ọbụla i tinyere aka gị. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị nʼala ahụ ọ na-enye gị.
DEU 28:9 Onyenwe anyị ga-eme ka i guzosie ike dịka ndị nsọ ya, dịka o sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa ime ma ọ bụrụ na i debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị, ma jee ije nʼụzọ ya niile.
DEU 28:10 Mgbe ahụ, ndị niile nọ nʼụwa ga-ahụta na ọ bụ aha Onyenwe anyị ka a kpọkwasịrị gị. Ha ga-atụkwa gị egwu.
DEU 28:11 Onyenwe anyị ga-eme ka ị babiga ụba oke na mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ihe ubi gị, nʼala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna gị na ọ ga-enye gị.
DEU 28:12 Onyenwe anyị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla.
DEU 28:13 Onyenwe anyị ga-eme ka ị bụrụ isi, ọ bụghị ọdụdụ. Ọ bụrụ na ị ṅaa ntị nʼiwu ndị a Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị taa, lezie anya ịgbaso ha, ị ga-anọgide nʼelu, ị gaghị anọ nʼokpuru.
DEU 28:14 Ewezugala onwe gị site nʼiwu niile ndị a m na-enye gị taa, maọbụ gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe, ịgbaso chi ndị ọzọ na ife ha ofufe.
DEU 28:15 Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na ị jụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, jụkwa ilezi anya, gbasoo iwu ya na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa, ọbụbụ ọnụ ndị a ga-adakwasị gị.
DEU 28:16 Ị ga-abụ onye a bụrụ ọnụ nʼobodo, bụrụ onye a bụrụ ọnụ nʼala ubi,
DEU 28:17 Abọ gị na ihe ịgwọ achịcha gị ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ.
DEU 28:18 Ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke ala gị ga-abụ, ya na ụmụ nke igwe anụ ụlọ gị, na ụmụ ehi gị na nke igwe ewu na atụrụ gị mụrụ.
DEU 28:19 Onye a bụrụ ọnụ ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata abata na mgbe ị na-apụ apụ.
DEU 28:20 Onyenwe anyị ga-ezidata nʼisi gị ọbụbụ ọnụ, na ọgbaaghara, tinyere nkọcha nʼihe niile nke i tinyere aka gị, tutu ruo mgbe ị ghọrọ onye e bibiri ebibi bụrụ onye lara nʼiyi na mberede, nʼihi ihe ọjọọ niile i mere site nʼịhapụ m.
DEU 28:21 Onyenwe anyị ga-ezite ajọ ọrịa nʼetiti gị tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị site nʼala ahụ ị gaje ịba nʼime ya inweta.
DEU 28:22 Onyenwe anyị ga-eti unu ọrịa na-eripịa eripịa, ahụ ọkụ na ọrịa na-aza anụ ahụ, oke okpomọkụ na mma agha, ụkọ mmiri ozuzo na ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu ga-abịakwasị gị tutu ruo mgbe i lara nʼiyi.
DEU 28:23 Mbara eluigwe nke ị na-ahụ anya ga-aghọ bronz, ala ị na-azọkwasị ụkwụ gị ga-aghọ igwe.
DEU 28:24 Onyenwe anyị ga-eme ka mmiri kwesiri izo nʼala gị ghọọ uzuzu na aja. Ha ga-esi na mbara eluigwe na-ezodata nʼala tutu ruo mgbe ị lara nʼiyi.
DEU 28:25 Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro gị merie gị nʼagha. Ị ga-esi otu ụzọ pụta ibuso ha agha, ma ị ga-esi ụzọ asaa gbalaga. Ị ga-aghọrọ ndị ụwa ihe a na-asọ oyi mgbe ha hụrụ ihe dakwasịrị gị.
DEU 28:26 Ozu unu ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe niile na anụ ọhịa niile ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha.
DEU 28:27 Onyenwe anyị ga-ezite etuto ndị Ijipt ka ha bịakwasị gị, ya na ọnya, na agba, na ọkọ. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji gwọọ ha.
DEU 28:28 Onyenwe anyị ga-ezitere gị isi mgbaka, na ikpu ìsì, na ọgbaaghara nke obi.
DEU 28:29 Ị ga-asọgharị isi nʼetiti ehihie dịka onye kpuru ìsì nʼasọgharị nʼọchịchịrị. Ọ dịghị ihe ọbụla ga-agara gị nke ọma. Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ị ga-abụ onye a na-emegbu emegbu, na onye a na-anapụ ihe ya nʼike oge niile, na-enweghị onye ga-anapụta gị.
DEU 28:30 Gị na nwanyị ga-enwe nkwekọrịta ịlụ di na nwunye, ma nwoke ọzọ ga-eduru ya dinaa ya nʼike. Ị ga-ewu ụlọ ma ị gaghị ebi nʼime ya. Ị ga-akụ ubi vaịnị ma ị gaghị eri mkpụrụ si na ya.
DEU 28:31 Nʼihu anya gị ka a ga-egbu ehi gị, ma ị gaghị ata iberibe anụ ya. A ga-anapụ gị ịnyịnya ibu gị nʼihu anya gị ma a gaghị eweghachiri gị ya. Atụrụ gị ka a ga-enye ndị iro gị. Ọ dịkwaghị onye ga-anapụta ha.
DEU 28:32 A ga-ewere ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nye ndị mba ọzọ. Ọ ga-agụ gị agụụ ogologo oge ka ị hụ ha anya, ma ị pụghị inyere ha aka.
DEU 28:33 Mba nke ị na-amaghị ga-eri mkpụrụ ubi ị tara ahụhụ kụọ nʼala gị. Ị ga-abụ naanị onye a na-emegbu emegbu na onye a na-akpagbu ụbọchị ndụ gị niile.
DEU 28:34 Ihe ndị a niile ị ga-eji anya gị hụ ga-eme ka i nwe isi mgbaka.
DEU 28:35 Onyenwe anyị ga-eme ka etuto nke na-egbu oke mgbu a na-apụghị ịgwọta agwọta too gị nʼikpere na ogwe ụkwụ gị abụọ, ọ ga-agbasa site nʼọbọ ụkwụ gị abụọ ruo nʼopi isi gị.
DEU 28:36 Onyenwe anyị ga-achụpụ gị na eze ahụ ị họpụtara nye onwe gị, chụpụ gị nye mba ọzọ, ebe gị na nna nna gị ha, na-amaghị. Nʼebe ahụ, ị ga-efe chi ndị ọzọ nke e ji osisi na nkume kpụọ.
DEU 28:37 Ị ga-abụ ihe iju anya, na ihe e ji atụ ilu, na ihe akụkọ, nʼetiti mba ahụ niile Onyenwe anyị ga-achụga gị.
DEU 28:38 Ị ga-akụ ọtụtụ mkpụrụ nʼubi ma ị ga-aghọta ntakịrị mkpụrụ, nʼihi na igurube ga-ericha ihe ị kụrụ nʼubi.
DEU 28:39 Ị ga-akọ ubi vaịnị lekọtakwa ya anya, ma ị gaghị aracha mkpụrụ ya maọbụ ṅụọ mmanya si na ya, nʼihi na ikpuru ga-eri ha.
DEU 28:40 Osisi oliv ga na-eto ebe niile, ma mmanụ oliv agaghị adị nke ị ga-ete nʼahụ nʼihi na mkpụrụ oliv ga-adasịsị na-akaghị aka oge ha mara ifuru.
DEU 28:41 Ị ga-amụta ụmụ ndị ikom na ndị inyom ma ha agaghị adịgide nʼihi na a ga-adọta ha nʼagha.
DEU 28:42 Igwe igurube ga-erichasị osisi niile dị nʼubi gị, ya na ihe ị kụrụ nʼubi gị.
DEU 28:43 Onye ọbịa bi nʼetiti gị ga-aba ụba karịa gị. Ihe ga na-agara ya nke ọma, ma ihe ga na-ajọrọ gị njọ.
DEU 28:44 Ọ ga-ebinye gị ihe, ọ bụkwaghị gị ga-ebinye ya! Ọ ga-abụ isi ma ị ga-abụ ọdụdụ.
DEU 28:45 Ọbụbụ ọnụ ndị a niile ga-abịakwasị gị. Ha ga-achụso gị ọsọ, chụkwute gị tutu ruo mgbe a lara gị nʼiyi, naanị nʼihi na ị jụrụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, na idebe iwu na ụkpụrụ ndị a o nyere gị.
DEU 28:46 Ha ga-abụ ihe ịrịbama na ihe ebube nye gị, na mkpụrụ gị niile, ruo mgbe ebighị ebi.
DEU 28:47 Nʼihi na ị jụrụ iji ọṅụ na obi ụtọ fee Onyenwe anyị Chineke gị nʼoge ihe na-agara gị nke ọma.
DEU 28:48 Ya mere, nʼọnọdụ agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ụkọ ka ị ga-efe ndị iro ahụ Onyenwe anyị na-ezite imegide gị. Ọ ga-anyakwasị yoku igwe nʼolu gị ruo mgbe ọ lara gị nʼiyi.
DEU 28:49 Onyenwe anyị ga-eme ka mba si nʼebe dị anya na nsọtụ ụwa, bịakwasị gị, imegide gị. Mba a ga-adị gara gara dịka ugo, ọ ga-abụkwa mba ị na-amaghị asụsụ ha,
DEU 28:50 Mba na-enweghị ihu ọchị nke na-adịghị asọpụrụ okenye maọbụ were ihuọma leta ụmụntakịrị.
DEU 28:51 Ha ga-erichapụ mkpụrụ nke anụ ụlọ gị niile na mkpụrụ nke ihe ubi gị niile tutu ruo mgbe ị ghọrọ ihe e bibiri ebibi. O nwekwaghị ihe ga-afọdụrụ gị, maọbụ ọka, maọbụ mmanya ọhụrụ maọbụ mmanụ oliv, maọbụ ụmụ ehi maọbụ ewu na atụrụ gị mụrụ, ruo mgbe e mere ka ị laa nʼiyi.
DEU 28:52 Mba ahụ ga-anọchigide obodo ndị ahụ niile dị nʼala gị tutu ruo mgbe mgbidi ndị ahụ niile e wusiri ike, nke ị na-atụkwasị obi dara. Ọ ga-anọchigide ndị ahụ niile dị nʼala ahụ niile Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
DEU 28:53 Ị ga-erikwa anụ ahụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom ndị Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼihi oke nnọchigide nke ndị agha nọchigidere gị na nʼihi oke mkpagbu nke ndị iro.
DEU 28:54 Ọ bụladị nwoke ahụ dịkasịrịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu ga-aghọ onye afọ tara mmiri nke ukwuu megide nwanne ya nwoke, maọbụ nwunye nke ọ hụrụ nʼanya, maọbụ ụmụ ya, ndị ka dị ndụ.
DEU 28:55 Ọ gaghị enye onye ọbụla nʼime ha ụfọdụ nʼime anụ ahụ ụmụ ndị ọ na-eri, nʼihi na ọ bụ naanị ya bụ ihe oriri fọdụrụ ya, nʼihi ahụhụ nke nnọchi ndị iro nọchiri ọnụ ụzọ obodo gị niile butere.
DEU 28:56 Nwanyị nke dịkarịsịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu, nke dị oke nwayọọ, nke ihe na-emetụta na ọ dịghị amasị ya ịzọgịdesị ọbụ ụkwụ ya ike nʼala, ga-ajụ ikenye di ya ọ hụrụ nʼanya, nwa ya nwoke maọbụ nwa ya nwanyị,
DEU 28:57 ọ bụladị akpanwa si nʼetiti ụkwụ ya pụta na ụmụ ọhụrụ ọ mụrụ. Nʼọnọdụ ọjọọ nʼoke ụkọ ya, ọ chọrọ iri ha na nzuzo, nʼihi ahụhụ nke ndị iro gị mere ka ọ bịakwasị gị nʼoge nnọchigide nke obodo gị niile.
DEU 28:58 Ọ bụrụ na i lezighị anya gbasoo okwu iwu niile e dere nʼime akwụkwọ a, ọ bụrụ na ị sọpụrụghị aha a dị ebube na nke dị egwu, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
DEU 28:59 Onyenwe anyị ga-ezitere gị na ụmụ ụmụ gị ihe otiti dị oke egwu, oke mbibi nke ga-adị ogologo oge, na ọrịa dị oke njọ nke na-adịghị ala ala.
DEU 28:60 Ọ ga-ezitere gị ọrịa ndị ahụ niile dị nʼIjipt, nke ị na-atụ ụjọ ha, ha ga-arapara gị nʼahụ.
DEU 28:61 Ọ bụghị naanị nke a! Onyenwe anyị ga-eme ka ụdị ọrịa ọbụla, na ụdị ihe otiti ọbụla, ọ bụladị ndị na-adịghị nʼime Akwụkwọ Iwu a, bịakwasị gị, tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị.
DEU 28:62 Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke eluigwe, maọbụ naanị mmadụ ole na ole nʼime gị ga-afọdụ. Ihe ndị a niile ga-emezu nʼihi na i geghị ntị nʼolu Onyenwe anyị bụ Chineke gị.
DEU 28:63 Dịka mmụba ị mụbara nʼọnụọgụgụ, na ịdị ukwuu nke akụnụba gị si bụrụ ihe nyere Onyenwe anyị obi ụtọ, otu a ka ọ ga-esi tọkwaa ya ụtọ ibibi gị, na ime ka ị daa ụkpa. Ọ ga-esi nʼala ahụ ị na-aga inweta hopu gị.
DEU 28:64 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ị gbasasịa nʼetiti mba niile, site nʼotu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ nke ọzọ. Nʼebe ahụ, ị ga-efekwa chi ndị ọzọ, nke gị, maọbụ nna nna gị ha, na-amaghị, chi e ji osisi na nkume kpụọ.
DEU 28:65 Nʼetiti mba ndị a, obi agaghị eru gị ala, ọbụ ụkwụ gị agaghị enwe ebe izuike. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị ga-enye gị mkpụrụobi na-ama jijiji, anya nke ike gwụrụ nʼihi enweghị olileanya, na obi na-ada mba.
DEU 28:66 Ndụ gị ga-ekonye nʼelu nʼihi oke egwu. Ị ga-anọ nʼegwu, ehihie na abalị, ị gaghị ejikwa ndụ gị nʼaka.
DEU 28:67 Nʼụtụtụ, ị ga-asị, “Ewoo, a sịkwa na ugbu a bụ uhuruchi!” Nʼuhuruchi ị ga-asịkwa, “Ewoo, a sịkwarị na ugbu a bụ ụtụtụ!” Ị ga-ekwu ihe ndị a nʼihi ihe egwu juru gị obi, na nʼihi ihe ndị ahụ niile anya gị na-ahụ.
DEU 28:68 Onyenwe anyị ga-eme ka i soro ụgbọ mmiri lọghachi nʼIjipt, nʼije ahụ m kwuru na ị gaghị ejekwa ọzọ. Nʼebe ahụ ị ga-ewere onwe gị resi ndị iro gị dịka ohu ndị ikom maọbụ ndị inyom, ma ọ dịghị onye ga-achọ ịzụ gị.
DEU 29:1 Ndị a bụ okwu nke ọgbụgba ndụ ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu ka ya na ụmụ Izrel gbaa nʼala Moab na-agbanweghị ọgbụgba ndụ ahụ ya na ha gbara nʼugwu Horeb.
DEU 29:2 Mosis kpọkọtara ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere nʼIjipt megide Fero, na ndị ozi ya, na ala ya niile.
DEU 29:3 Anya unu hụrụ oke nwale niile, na ihe ịrịbama ndị ahụ, na ọrụ ebube niile ahụ.
DEU 29:4 Ma tutu ruo taa, Onyenwe anyị enyebeghị unu obi nwere nghọta, na anya na-ahụ ụzọ, maọbụ ntị na-anụ ihe, nke ga-enyere unu aka ịṅomi ihe ndị a niile.
DEU 29:5 Ma Onyenwe anyị na-asị, “Nʼime iri afọ anọ ndị ahụ nke m duuru unu nʼime ọzara, uwe unu emeghị ochie, akpụkpọụkwụ unu akapụghị nʼụkwụ unu.
DEU 29:6 Ọ dịghị achịcha unu riri, ọ dịkwaghị mmanya maọbụ ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya unu ṅụrụ. E mere m ihe ndị a ime ka unu mata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”
DEU 29:7 Mgbe unu rutere ebe a, Saịhọn, eze ndị Heshbọn, na Ọg, eze ndị Bashan, pụtara ibuso anyị agha, ma anyị lụgburu ha.
DEU 29:8 Anyị weere ala ha nye agbụrụ Ruben, na Gad, na otu ọkara ebo Manase, dịka ihe nketa ha.
DEU 29:9 Nʼihi ya, lezie anya idebe ụkpụrụ niile nke ọgbụgba ndụ a, ka ihe niile unu na-eme gaara unu nke ọma.
DEU 29:10 Unu niile, ndị ndu unu, na ndịisi unu, na okenye, na ndịisi ọchịchị, na ndị ikom niile nke Izrel, unu ndị guzo nʼihu Onyenwe anyị Chineke taa,
DEU 29:11 na ụmụntakịrị unu, na ndị nwunye unu, na ndị ọbịa bi nʼetiti unu, ndị na-egburu unu nkụ, na ndị na-echukwara unu mmiri.
DEU 29:12 Unu guzo nʼebe a taa ka unu na Onyenwe anyị Chineke gbaa ndụ. Unu guzokwa, maka ọgbụgba ndụ a unu na Onyenwe anyị na-agba taa, nke e ji ịṅụ iyi mesie ike,
DEU 29:13 ime ka ọ pụta ìhè nye unu taa na unu bụ ndị nke ya, imekwa ka unu mata na ọ bụ Chineke unu, dịka o kwere nna nna unu ha, Ebraham, na Aịzik, na Jekọb na nkwa.
DEU 29:14 Ọgbụgba ndụ a nke ya na ịṅụ iyi so nke m na-eme ka ọ dịrị abụghị naanị nʼihi unu,
DEU 29:15 ndị soro anyị guzo nʼebe a taa, nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, kama ọ bụkwa nʼihi ndị ahụ na-anọghị nʼebe a.
DEU 29:16 Unu onwe unu maara otu anyị si bie nʼala Ijipt, na otu anyị si gafee mba ndị ahụ niile anyị gafere nʼụzọ.
DEU 29:17 Unu hụrụ nʼetiti ha ihe arụ ha niile, na arụsị niile e ji osisi, na nkume na ọlaọcha, na ọlaedo kpụọ.
DEU 29:18 Lezienụ anya ka unu hụ na obi onye ọbụla nʼime unu, nwoke maọbụ nwanyị, agbụrụ maọbụ ebo ọbụla nʼIzrel, esighị nʼebe Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nọ pụọ, bido chewe echiche ife chi ndị mba ọzọ ndị a niile. Lezienụ anya hụ na mgbọrọgwụ na-ewepụta nsi na-elu ilu dị otu a adịghị nʼetiti unu.
DEU 29:19 Mgbe onye dị otu a nụrụ okwu ịṅụ iyi a, na ha ga-agọzi onwe ha, na-eche, “Ihe ga-agara m nke ọma, ọ bụ ezie na m nọgidere na-agbaso ụzọ isiike m.” Ha ga-eweta mbibi nye ala a gbara mmiri nke ọma nyekwa ala ahụ kpọrọ nkụ.
DEU 29:20 Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agbaghara onye dị otu a! Iwe ya, na ekworo ya, ga-adị ọkụ megide nwoke ahụ. Ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a ga-abịakwasịkwa ya. Onyenwe anyị ga-ehichapụkwa aha ya, ka a ghara ịnụkwa ihe banyere ya nʼụwa.
DEU 29:21 Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti ya na ebo niile nke Izrel, maka iwetara ya mbibi, dị ka ọbụbụ ọnụ niile nke ọgbụgba ndụ nke e dere nʼime Akwụkwọ Iwu a si dị.
DEU 29:22 Mgbe ahụ, ụmụ unu ndị ga-eso unu nʼọgbọ ndị dị nʼihu, na ndị ọbịa si ebe dị anya bịa, ga-ahụ oke ihe otiti ọjọọ a bịakwasịrị ala a, ya na ọrịa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya.
DEU 29:23 Ala ahụ niile ga-abụ ala nnu, nke ọkụ repịara, ala nke a na-adịghị akụ ihe ọbụla nʼime ya, ala na-adịghị amị mkpụrụ, nke ahịhịa na-adịghị epu nʼelu ya. Ala dịka ala Sọdọm na Gọmọra, na Adma, na Zeboiim, nke Onyenwe anyị sitere nʼoke iwe ya mebie.
DEU 29:24 Mba niile ga-ajụ sị, “Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ihe dị otu a nʼala a? Gịnị kpatara oke iwe ọkụ a?”
DEU 29:25 Ọsịsa ya ga-abụ, “Ọ bụ nʼihi na ndị a hapụrụ idebe ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị, Chineke nke nna nna ha gbara, ọgbụgba ndụ ha na ya gbara mgbe o mere ka ha site nʼIjipt pụta.
DEU 29:26 Nʼihi na ha fere chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha, bụ chi ndị nke ha na-amaghị, chi ndị nke ọ na-enyeghị ha.
DEU 29:27 Ọ bụ ya mere iwe Onyenwe anyị ji dị ọkụ megide ala a, meekwa ka o zidata nʼisi ha ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a.
DEU 29:28 Nʼoke iwe ya na ọnụma ya ka Onyenwe anyị ji hopu ha site nʼala ha, werekwa ha tụba nʼala ọzọ, dịka ọ dị ugbu a.”
DEU 29:29 Ihe niile e zoro ezo dịrị Onyenwe anyị Chineke anyị, ma ihe ndị ahụ niile e kpughere ekpughe dịịrị anyị, dịkwara ụmụ anyị ruo mgbe ebighị ebi, ka anyị nwee ike ịgbaso na imezu okwu niile nke iwu a.
DEU 30:1 Mgbe ihe ndị a niile ga-emezu nʼebe unu nọ, ya bụ, ngọzị niile na ọbụbụ ọnụ niile m gụpụtara nʼihu unu, ọ bụrụ na unu ga na-atụgharị uche na ha nʼetiti mba ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-achụba unu,
DEU 30:2 ọ bụrụkwa na unu ekpebie nʼobi unu nʼoge ahụ ịlọghachikwute Onyenwe anyị Chineke unu, ọ bụrụ na unu, na ụmụ unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile mezuo iwu ndị a niile m nyere unu taa.
DEU 30:3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-anapụta unu. Ọ ga-enwe obi ebere nʼebe unu nọ kpọkọtakwa unu site na mba niile ebe ọ chụsasịrị unu.
DEU 30:4 A sịkwarị na ọ bụ nʼala dị na nsọtụ ụwa nʼokpuru eluigwe ka a chụgara unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-achịkọta unu, kpọghachitekwa unu.
DEU 30:5 Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọlata unu nʼala ahụ bụ nke nna nna unu ha. Unu ga-enwetakwa ya, ọ ga-eme ka ihe gara unu nke ọma, meekwa ka unu baa ụba karịa nna nna unu ha.
DEU 30:6 Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ebi obi unu, na obi ụmụ unu, na nke ụmụ ụmụ unu ugwu, ka unu were obi unu niile na mmụọ unu niile, hụ ya nʼanya, ma dịkwa ndụ.
DEU 30:7 Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-eme ka ọbụbụ ọnụ ndị a bịakwasị ndị iro unu, ndị kpọrọ unu asị na ndị na-akpagbu unu.
DEU 30:8 Unu ga-emesịakwa rubere Onyenwe anyị isi, gbasookwa iwu ya niile nke m na-enye unu taa.
DEU 30:9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-eme ka unu babiga ụba oke nʼọrụ niile nke aka unu, nʼime mkpụrụ nke afọ, nʼime mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ala ubi gị. Obi ga-atọkwa Onyenwe anyị ụtọ ọzọ, ime gị ka ị baa ụba dịka ọ tọrọ ya nʼebe nna unu ha nọ.
DEU 30:10 Ma ọ bụrụ na unu erubere Onyenwe anyị bụ Chineke unu isi, debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile nke e dere nʼAkwụkwọ iwu a, jirikwa obi unu niile na mmụọ unu niile bịaghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
DEU 30:11 Idebe iwu ndị a m na-enye unu taa abụghị ọrụ sịrị ike, ọ bụkwaghị ihe karịrị unu ike ime.
DEU 30:12 Nʼihi na iwu ndị a adịghị nʼeluigwe nke ị ga-eji sị, “Onye ga-arịgo nʼeluigwe wedatara m ya ka m nụ ihe ọ na-ekwu, ma debekwa ya.”
DEU 30:13 Iwu a adịghịkwa nʼofe ọzọ nke oke osimiri, nke ị ga-eji sị, “Onye ga-agafe ga weta ya, kpọsaa ya nye anyị ka anyị nụ, ma debekwa ihe ọ na-ekwu?”
DEU 30:14 Mba, okwu ahụ dị gị nso, ọ dị gị nʼọnụ, dịrịkwa nʼobi gị, ka i nwee ike idebe ha.
DEU 30:15 Lee, edoola m nʼihu gị taa ndụ na ọganihu, ọnwụ na ịla nʼiyi.
DEU 30:16 Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta.
DEU 30:17 Ma ọ bụrụ na obi gị e si nʼiso ya tụgharịa, ọ bụrụkwa na ị jụ ige ntị, ọ bụrụ na a dọkpụfuo gị mee ka i fee chi ndị ọzọ ofufe ma ịkpọ isiala nye ha,
DEU 30:18 agwala m gị hoohaa taa, na ị ga-ala nʼiyi, ị gaghị enwe ogologo ndụ nʼala ahụ ị na-agafe osimiri Jọdan inweta.
DEU 30:19 Ana m akpọku eluigwe na ụwa taa ka ha bụrụ ndị akaebe m, na edebela m nʼihu gị ọnwụ na ndụ, debekwa nʼihu gị ngọzị na ọbụbụ ọnụ. Ugbu a, họrọ ndụ, ka gị na ụmụ gị dị ndụ
DEU 30:20 ka ị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ṅaa ntị nʼolu ya, daberekwa na ya. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ndụ gị, ọ ga-enye gị ụbọchị ndụ gị niile nʼala ahụ o kwere nkwa ị nye nna nna gị ha Ebraham, na Aịzik, na Jekọb.
DEU 31:1 Mgbe Mosis gwachara ụmụ Izrel okwu ndị a niile,
DEU 31:2 ọ gwakwara ha okwu ọzọ sị, “Ugbu a, agbaala m otu narị afọ na iri afọ abụọ! Enwekwaghị m ike idu unu, nʼihi na Onyenwe anyị agwala m sị, Ị gaghị agafe osimiri Jọdan.
DEU 31:3 Onyenwe anyị Chineke gị nʼonwe ya ga-ebu gị ụzọ gabiga osimiri a. Ọ ga-ebibi mba niile ndị a nʼihu gị. Ị ga-enwetakwa ala ha. Joshua ga-edu gị gabiga osimiri a, dịka Onyenwe anyị kwuru.
DEU 31:4 Onyenwe anyị ga-emekwa ha ihe o mere Saịhọn na Ọg, bụ eze ndị Amọrait, ndị o kpochapụrụ ha na ala ha.
DEU 31:5 Onyenwe anyị ga-enyefe ndị bi nʼebe ahụ nʼaka unu, unu ga-ekpochapụkwa ha dịka m nyere unu nʼiwu.
DEU 31:6 Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-anọnyere unu. Ọ gaghị agbakụta unu azụ, ọ gakwaghị ahapụ unu.”
DEU 31:7 Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Joshua, gwa ya okwu nʼihu ụmụ Izrel, sị ya, “Dị ike! Nwee obi ike! Nʼihi na ọ bụ gị ga-edu ndị a baa nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi inye nna nna ha, ị ga-emekwa ka ha keta ala a dịka ihe nketa ha.
DEU 31:8 Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba.”
DEU 31:9 Mgbe ahụ, Mosis depụtara iwu ndị ahụ niile nʼakwụkwọ, were ya nye ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Mosis nyekwara ndị okenye Izrel akwụkwọ a e dere iwu niile.
DEU 31:10 Mgbe ahụ, Mosis nyere ha iwu sị, “Na ngwụcha afọ asaa ọbụla, nʼafọ ahụ a na-akagbu ụgwọ niile, nʼoge a na-eme Mmemme ụlọ Ikwu,
DEU 31:11 mgbe Izrel niile ga-abịa nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta, ị ga-agụpụta ihe a site nʼakwụkwọ iwu a nʼihu mmadụ niile ka ha nụrụ ya.
DEU 31:12 Kpọkọta mmadụ niile nʼotu ebe, ndị ikom, na ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa bi nʼetiti obodo unu, ka ha nụrụ, ma mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke unu na ilezi anya ịgbaso okwu niile dị nʼiwu a.
DEU 31:13 Ụmụntakịrị ha, ndị na-amabeghị iwu ndị a, aghaghị ịnụ na ịmụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke unu, ụbọchị ndụ unu niile nʼala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.”
DEU 31:14 Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Lee, ụbọchị ọnwụ gị na-abịaru nso. Kpọrọ Joshua ka gị na ya soro bịa nʼụlọ nzute ebe m ga-anọ nye ya ọrụ ọ ga-arụ.” Mosis na Joshua sooro bịa guzo onwe ha nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
DEU 31:15 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri ha onwe ya nʼime ogidi igwe ojii nke guzochiri ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
DEU 31:16 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ị ga-anwụ, jekwuru nna nna gị ha. Mgbe ị nwụrụ, ndị a ga-amalite ife chi ọzọ ofufe ndị dị nʼala ahụ ha na-abanye. Ha ga-agbakụta m azụ, mebie ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara.
DEU 31:17 Nʼụbọchị ahụ, iwe m ga-adị ọkụ megide ha, aga m agbakụta ha azụ, zoo ihu m nʼebe ha nọ. A ga-alakwa ha nʼiyi. Ọdachi na ahụhụ dị iche iche ga-abịakwasị ha, nke ga-eme ka ha sị, ‘Chineke anyị anọkwaghị nʼetiti anyị, ọ bụ ya mere ọdachi ndị a ji bịakwasị anyị.’
DEU 31:18 Aga m echepụ ihu m site nʼebe ha nọ nʼụbọchị ahụ, nʼihi ajọ omume ha nke ife chi ọzọ ofufe.
DEU 31:19 “Ugbu a, depụtaranụ onwe unu abụ a nʼakwụkwọ, kuziekwara ya ụmụ Izrel, ka ọ bụrụ ihe akaebe m megide ha.
DEU 31:20 Mgbe m mere ka ha bata nʼala ahụ m kwere nna nna ha na nkwa, ala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-erugharị nʼime ya, mgbe ha rijukwara afọ, baakwa ụba, ha ga-ebido ife chi ọzọ ofufe, jụ m, ma mebikwaa ọgbụgba ndụ m.
DEU 31:21 Ma mgbe ọtụtụ ihe ọdachi na ahụhụ ga-abịakwasị ha, abụ a ga-eme ka ha cheta ihe mere nsogbu ha niile ji bịakwasị ha, nʼihi na abụ a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Amaara m nke ọma ugbu a, ọ bụladị tupu ha abanye nʼala ahụ m kwere nkwa inye ha site nʼịṅụ iyi, ụdị mmadụ ha bụ.”
DEU 31:22 Ya mere, nʼụbọchị ahụ, Mosis dere abụ ahụ, kuziekwara ya ụmụ Izrel.
DEU 31:23 Mgbe ahụ Onyenwe anyị nyere Joshua nwa Nun iwu sị ya, “Dị ike, nwee obi ike, ị ghaghị ịkpọbata ụmụ Izrel nʼala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee ha na nkwa. Mụ onwe m ga-anọnyere gị.”
DEU 31:24 Mgbe Mosis dechara okwu niile nke iwu ndị a nʼakwụkwọ, site na mbido ruo nʼọgwụgwụ,
DEU 31:25 o nyere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị iwu sị ha,
DEU 31:26 “Werenụ Akwụkwọ Iwu a tinye ya nʼakụkụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ọ bụrụ ihe ịgba ama megide unu.
DEU 31:27 Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị nnupu isi, na ndị isiike. Lee, ọ bụladị taa m nọ ndụ nʼetiti unu, unu na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ, unu ga-esi aṅaa ghara inupu isi mgbe m nwụrụ?
DEU 31:28 Kpọkọtaanụ ndị okenye unu niile, na ndị ọchịchị agbụrụ unu niile, ka m kwupụta okwu ndị a mgbe ha na-anụ ya. Ka m kpọkuokwa eluigwe na ụwa ka ha gbaa ama megide ha.
DEU 31:29 Nʼihi na amaara m na mgbe m nwụrụ, unu ga-aghọ ndị rụrụ arụ nke ukwuu, unu ga-ewezuga onwe unu site nʼebe iwu ndị ahụ m nyere unu dị. Amakwaara m na nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, ihe ọjọọ ga-adakwasị unu, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere nʼihu Onyenwe anyị nke unu ji kpasuo ya iwe site nʼihe ndị ahụ unu ji aka unu kpụọ.”
DEU 31:30 Ya mere, Mosis gụpụtara okwu niile dị nʼabụ a site na mbido ruo ọgwụgwụ na ntị nzukọ ndị Izrel niile.
DEU 32:1 Gee ntị, gị eluigwe, nụrụ ihe m na-ekwu! Gee ntị, ụwa, nụrụ okwu si m nʼọnụ.
DEU 32:2 Ka okwu m daa dịka mmiri ozuzo ka okwu m daa dịka igirigi, ka ọ daa dịka nshansha mmiri nʼelu ahịhịa, dịka oke mmiri ozuzo nʼahịhịa na-epupụta epupụta.
DEU 32:3 Aga m eto aha Onyenwe anyị toonu ịdị ukwuu Chineke anyị!
DEU 32:4 Ọ bụ oke nkume ahụ, ọrụ ya zuruoke, ụzọ ya niile ziri ezi. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, nke na-adịghị eme ihe ọjọọ, onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.
DEU 32:5 Ha emerụọla onwe ha, ha abụkwaghị ụmụ ya, ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ndị ụdịdị ha gbanwere agbanwe
DEU 32:6 Ọ bụ otu a ka unu si emeso Onyenwe anyị unu ndị nzuzu, ndị na-enweghị uche? Onyenwe anyị ọ bụghị nna unu, onye kere unu, onye kpụrụ unu mee ka unu guzosie ike?
DEU 32:7 Cheta ụbọchị ochie ndị ahụ gara aga, tulee ọgbọ ndị ahụ gara aga jụọ nna gị, ọ ga-akọrọ gị. Jụọ ndị okenye gị, ha ga-eme ka o doo gị anya.
DEU 32:8 Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha, mgbe o kesara ụmụ mmadụ, mgbe o guzobere oke ala nye ndị niile dịka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel si dị.
DEU 32:9 Nʼihi na oke Onyenwe anyị nwetara bụ ndị ya Jekọb bụ ihe nketa e kenyere ya.
DEU 32:10 Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya, nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ. O kpuchitere ya, lezie ya anya, o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya,
DEU 32:11 dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya, nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya, nke na-agbasapụ nku ya ijide ha, nke na-ebu ha na nku ya,
DEU 32:12 Onyenwe anyị naanị ya duru ya, chi ala ọzọ esokwaghị ya.
DEU 32:13 O mere ka ọ rịkwasị nʼebe niile dị elu nke ala ahụ, jiri mkpụrụ na-amị nʼala ubi ahụ zụọ ya. O ji mmanụ aṅụ si na nkume zụọ ya, ya na mmanụ si nʼoke nkume,
DEU 32:14 na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ehi, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ewu na atụrụ, na ụmụ atụrụ na mkpi gbara abụba, na oke ebule Bashan dị ezi mma, tinyere ezi obi ọka wiiti. Ị ṅụkwara mmanya na-agbọ ụfụfụ, nke bụ ọbara mkpụrụ vaịnị.
DEU 32:15 Ma Jeshurun mara abụba, ma gbagharịa ụkwụ ya, ebe nri juru ya ọnụ, o buru ibu, maa mma ile anya. Ọ hapụrụ Chineke kpụrụ ya, jụ oke nkume ahụ, bụ Onye Nzọpụta ya.
DEU 32:16 Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya, meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha.
DEU 32:17 Ha chụrụ aja nye ụmụ mmụọ, ndị na-abụghị Chineke, bụ chi ndị ha na-amaghị, chi ndị ka pụtara ọhụrụ, chi ndị ahụ nna nna ha na-atụghị ụjọ ha.
DEU 32:18 Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ, i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị.
DEU 32:19 Onyenwe anyị hụrụ ihe dị otu a, jụ ha, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom kpasuru ya iwe.
DEU 32:20 “Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru, “ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ, nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi.
DEU 32:21 Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m, jiri arụsị ha na-abaghị uru mee ka iwe wee m. Mụ onwe m ga-esite na ndị na-abụghị ndị kpalie ekworo ha, sitekwa na mba na-enweghị nghọta kpalie iwe ya.
DEU 32:22 Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m, ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa. Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile, ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile.
DEU 32:23 “Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha, zipụ àkụ m niile megide ha.
DEU 32:24 Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha, na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu. Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha, na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya.
DEU 32:25 Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha. Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi, ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ.
DEU 32:26 Ekwuru m na m ga-achụsasị ha, hichapụ ncheta ọbụla banyere ha nʼetiti ụmụ mmadụ.
DEU 32:27 Ma ihe banyere ịnya isi onye iro tinyere m ụjọ nʼobi, ka onye iro ghara ịghọtahie kwuo sị, ‘Aka anyị ewetarala anyị mmeri, ọ bụghị Onyenwe anyị mere ihe ndị a niile.’ ”
DEU 32:28 Ha bụ mba na-enweghị uche, ndị na-enweghị mmụọ nghọta ọbụla nʼime ha.
DEU 32:29 A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uche nakwa ịghọta ihe ikpeazụ ha ga-abụ.
DEU 32:30 Kedụ ka otu onye ga-esi chụọ otu puku mmadụ ọsọ, kedụ ka mmadụ abụọ ga-esi chụọ iri puku mmadụ ọsọ, ma ọ bụghị na Oke Nkume ha erefuola ha, ma ọ bụghị na Onyenwe anyị echepụla ihu ya nʼebe ha nọ?
DEU 32:31 Nʼihi na nkume ha adịghị ka Nkume anyị, dịka ndị iro anyị, nʼonwe ha, jiri ọnụ ha kwuo.
DEU 32:32 Osisi vaịnị ha si nʼosisi vaịnị Sọdọm, na nʼubi dị na Gọmọra mkpụrụ vaịnị ha jupụtara na nsi, ụyọkọ vaịnị ha jupụtara nʼilu ilu.
DEU 32:33 Mmanya vaịnị ha bụ elo agwọ, elo ajụala na-ebute ọnwụ.
DEU 32:34 “Nke a ọ bụghị ihe m dokọtarala chere oge, chezie ha nke ọma nʼụlọakụ m?
DEU 32:35 Ọ bụ m ka ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi. Mgbe oge ruru ụkwụ ha ga-agbuchapụ, ụbọchị mbibi ha na-abịa nso, ịla nʼiyi ha chị ọsọ na-abịakwasị ha.”
DEU 32:36 Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe, ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị ohu ya, mgbe ọ hụrụ na ike ha nwere agwụla, mgbe otu onye na-agaghị afọdụ, ohu na onye nwe onwe ya.
DEU 32:37 Ọ ga-asịkwa, “Ugbu a, olee ebe chi niile ha nọ, bụ oke nkume ahụ ha gbabara izere ndụ nʼime ya,
DEU 32:38 chi ndị ahụ riri abụba ihe ịchụ aja ha, ṅụọkwa mmanya ha ji chụọ aja ihe ọṅụṅụ? Ha bilie bịa nyere unu aka! Ha bụrụ ụlọ ndo nye unu!”
DEU 32:39 “Ugbu a, hụnụ na mụ onwe m abụ m ya! Ọ dịghịkwa chi ọzọ dị ma ọ bụghị m. Mụ onwe m na-eme ka a nwụọ, mụ onwe m na-eme ka a dị ndụ. Mụ onwe m na-etipụ mmadụ ọnya, mụ onwe m na-agwọ ya, mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụta onye m ji nʼaka m.
DEU 32:40 Ana m eweli aka nʼeluigwe na-ekwupụta nʼịnụ iyi sị, dịka m na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,
DEU 32:41 mgbe m mụrụ mma agha m na-egbu amụma, mgbe aka m jidere mma agha ahụ nʼọnọdụ ikpe ikpe, aga m abọ ọbọ megide ndị iro, kwụghachi ndị ahụ niile kpọrọ m asị.
DEU 32:42 Aga m eme ka àkụ m ṅụjuo ọbara afọ, ma mma agha ga-ebibi anụ ahụ, ọbara ndị e gburu egbu, na nke ndị a dọtara nʼagha, na isi ndị ndu ndị iro.”
DEU 32:43 Ṅụrịanụ ọṅụ mba niile, unu na ndị ya, nʼihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya, ọ ga-abọ ọbọ megide ndị iro ya, kpuchiere ala ya na ndị ya mmehie ha.
DEU 32:44 Mosis na Joshua nwa Nun soro bịa gụpụta mkpụrụ okwu abụ a na ntị ndị Izrel.
DEU 32:45 Mgbe Mosis gụpụtachara abụ a nye ndị Izrel,
DEU 32:46 ọ gwara ha okwu ndị a sị, “Na-atụgharịnụ uche nʼokwu niile m kwupụtara nye unu taa, ka unu si otu a nyefeekwa ya nʼaka ụmụ unu, ka ha onwe ha lezie anya debe okwu niile dị nʼiwu ndị a.
DEU 32:47 Nʼihi na okwu ndị a abụghị okwu efu, ndụ unu dabeere na ha. Unu debe ha, unu ga-adị ndụ ogologo nʼime ala ahụ unu na-aga inweta nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.”
DEU 32:48 Nʼotu ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
DEU 32:49 “Bilie ga nʼugwu Nebo nke dị nʼetiti ugwu Abarim, nʼala Moab, na ncherita ihu Jeriko, leekwa ala Kenan anya, bụ ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel dịka ihe nketa ha.
DEU 32:50 Mgbe ị hụsịrị ala a, ị ga-anwụ nʼebe ahụ nʼelu ugwu ahụ, lakwurukwa nna nna gị ha, dịka Erọn nwanne gị si nwụọ nʼugwu Hor, lakwuru ha.
DEU 32:51 Nʼihi na gị na Erọn jụrụ irubere m isi nʼihu ụmụ Izrel, na mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin, unu edoghị m nsọ nʼihu ndị Izrel.
DEU 32:52 Nʼihi ya, ị ga-esite nʼebe dị anya hụ ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel, ma ị gaghị aba nʼime ya.”
DEU 33:1 Nke a bụ ngọzị Mosis, onye nke Chineke, jiri gọzie ụmụ Izrel, tupu ọ nwụọ.
DEU 33:2 Ọ sịrị, “Onyenwe anyị si nʼugwu Saịnaị bịa, ọ waliteere ha site nʼugwu Sia, o nwupụtara site nʼugwu Paran Ya na igwe ndị nsọ so bịa site nʼakụkụ ndịda, site nʼala ala ugwu ahụ.
DEU 33:3 Nʼezie, ọ bụ gị na-ahụ ndị mmadụ ahụ nʼanya, ndị nsọ ahụ niile dị gị nʼaka. Nʼụkwụ gị ka ha na-ada kpọọ isiala, gị na-akụziri ha ihe,
DEU 33:4 iwu ahụ Mosis nyere anyị, ihe onwunwe nke ọgbakọ Jekọb.
DEU 33:5 Ọ bụ ya bụ eze na Jeshurun, mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ ha na ebo niile nke Izrel.
DEU 33:6 “Ka ebo Ruben dịrị ndụ ghara ịnwụ, ma ka ọnụọgụgụ ndị ikom ya dịrị ole na ole.”
DEU 33:7 Ihe a ka o kwuru banyere Juda, “Nụrụ, Onyenwe anyị, akwa Juda, kpọlata ya nʼebe ndị ya nọ. Aka ya ka o ji alụrụ onwe ya ọgụ ichebe ihe o bu nʼuche. Bụụrụ ya onye inyeaka megide ndị iro ya.”
DEU 33:8 Banyere Livayị o kwuru sị, “Urim na Tumim gị dịịrị ohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi. Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa, gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba.
DEU 33:9 Onye ahụ lere nne na nna ya anya sị, ‘Ejighị m ha kpọrọ ihe.’ Ọ gụnyeghịkwa ụmụnne ya dịka ndị ọ maara, ọ nabatakwaghị ụmụ nke aka ya. Ma o debere okwu gị, cheziekwa ọgbụgba ndụ gị.
DEU 33:10 Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị, na-akụzikwara Izrel iwu gị. Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị, na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị.
DEU 33:11 Gọzie akụnụba ya Onyenwe anyị, ka ọrụ aka ya bụrụkwa ihe na-atọ gị ụtọ. Tijie ụkwụ ndị niile na-ebili imegide ya, tigbuo ndị iro ya ka ha ghara inwe ike ibili ọzọ.”
DEU 33:12 Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị, “Ka onye ahụ Onyenwe anyị hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya. Nʼihi na ọ ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile. Ọ bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya na-anọ.”
DEU 33:13 Banyere Josef o kwuru sị, “Ka Onyenwe anyị gọzie ala ya, ya jiri igirigi dị oke ọnụahịa nke eluigwe dị nʼelu, na ogbu mmiri dị nʼokpuru ala,
DEU 33:14 na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta, na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta,
DEU 33:15 na onyinye ọma niile si nʼugwu ukwu ochie, na ịba ụba ugwu ebighị ebi ndị ahụ,
DEU 33:16 na onyinye ọma niile si nʼala na uju ya niile, na ihuọma onye ahụ na-ebi nʼọhịa nta ahụ na-enwu ọkụ. Ka ihe ndị a niile dịrị nʼisi Josef, nʼiku anya onye bụ nwa eze, nʼetiti ụmụnna ya.
DEU 33:17 Nʼịma mma, ọ dị ka nwa oke ehi e bụ ụzọ mụọ, mpi ya dị ka mpi ehi ọhịa. Ya ka ọ ga-eji sọda mba niile ọ bụladị mba ndị ahụ dị na nsọtụ ụwa. Otu a ka iri puku kwụrụ puku ndị Ifrem dị otu a ka imerime puku ndị Manase dị.”
DEU 33:18 Banyere Zebụlọn, o kwuru sị, “Ṅụrịa, gị Zebụlọn, nʼọpụpụ gị, ma gị Isaka, ṅụrịa nʼebe obibi gị.
DEU 33:19 Ha ga-akpọ ndị mmadụ oku nʼelu ugwu ukwuu, nọ nʼebe ahụ chụọ aja ezi omume, ha ga-eri site nʼịba ụba nke ihe dị nʼosimiri, site nʼakụ nzuzo dị nʼaja.”
DEU 33:20 Banyere Gad, o kwuru sị, “Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara. Gad na-ebi dịka ọdụm, na-adọkapụ aka maọbụ isi.
DEU 33:21 Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya; oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya. Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ, o mezuru ezi ihe dị Onyenwe anyị nʼobi, na ikpe ya niile banyere Izrel.”
DEU 33:22 Banyere Dan, o kwuru sị, “Dan bụ nwa ọdụm, onye na-esi na Bashan mapụta.”
DEU 33:23 Banyere Naftalị, o kwuru sị, “Naftalị bụ onye njupụta nke ihuọma Onyenwe anyị dịrị, o jupụtakwara na ngọzị ya, ọ ga-eketa akụkụ ndịda nke iyi ukwu.”
DEU 33:24 Banyere Asha, o kwuru sị, “Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ, ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ, ka o jirikwa mmanụ saa ụkwụ ya.
DEU 33:25 Ihe mkpọchi nke ọnụ ụzọ ama gị ga-abụ bronz na igwe, dịka ụbọchị ndụ gị niile si dị, otu a ka ịdị ike gị ga-adị.
DEU 33:26 “O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun, onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka, onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya.
DEU 33:27 Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị. Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị. Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị, ‘Bibie ha!’
DEU 33:28 Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo, isi iyi mmiri Jekọb dị chịm, nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ ebe igirigi nke eluigwe na-ada.
DEU 33:29 Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, gị Izrel, onye dị ka gị ndị Onyenwe anyị zọpụtara? Ọ bụ ọta gị na onye inyeaka gị, na mma agha gị dị ebube. Ndị iro gị ga-eji egwu daa nʼihu gị, ị ga-azọdakwa ebe ha niile dị elu.”
DEU 34:1 Mgbe ahụ, Mosis sitere na mbara ala Moab rigoruo nʼelu nʼugwu Nebo, ruo nʼelu Pisga, nke dị na ncherita ihu Jeriko. Nʼebe ahụ Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ala ahụ niile anya site na Gilead ruo Dan;
DEU 34:2 ya na ala Naftalị niile nʼoke ala Ifrem, na nke Manase, na ala Juda niile ruo nʼosimiri Mediterenịa.
DEU 34:3 Mosis hụkwara ala Negev, na akụkụ ala ahụ niile dị site na Ndagwurugwu Jeriko, obodo nkwụ, ruo Zoa.
DEU 34:4 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Nke a bụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee Ebraham, Aịzik na Jekọb nkwa mgbe m kwuru sị, ‘Aga m enye ya ụmụ ụmụ gị.’ Ugbu a emeela m ka i jiri anya gị hụ ya ma ị gaghị agabiga banye nʼime ya.”
DEU 34:5 Ya mere, Mosis, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ nʼebe ahụ, nʼala Moab, dịka Onyenwe anyị kwuru.
DEU 34:6 Onyenwe anyị liri ya na Moab, na ndagwurugwu chere ihu na Bet-Peoa, ma ruo taa, ọ dịghị onye ọbụla maara ebe ili ya dị.
DEU 34:7 Mosis gbara narị afọ na iri afọ abụọ mgbe ọ nwụrụ, ma nʼoge ahụ ike ka dị ya nʼahụ, anya ya na-ahụkwa ụzọ nke ọma.
DEU 34:8 Ụmụ Izrel ruru ụjụ nʼihi Mosis, iri ụbọchị atọ nʼobosara ala Moab, tutu ruo mgbe oge iru ụjụ na ịkwa akwa gasịrị.
DEU 34:9 Joshua nwa Nun, jupụtara na mmụọ amamihe, nʼihi na Mosis ebikwasịla ya aka nʼisi. Ya mere, ụmụ Izrel ṅara Joshua ntị, gbasookwa iwu niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼọnụ Mosis.
DEU 34:10 Ọ dịbeghị onye amụma ọzọ pụtarala nʼala Izrel niile, nke dịka Mosis, onye ya na Onyenwe anyị kparịtara ụka ihu na ihu,
DEU 34:11 onye mere ihe ịrịbama ndị a niile, rụọkwa ọrụ ebube niile nke Onyenwe anyị ziri ya ka o mee nʼIjipt, nʼihu Fero, na ndị ozi ya niile, nakwa nʼala ahụ niile.
DEU 34:12 Nʼihi na o nwebekwaghị onye ọzọ gosirila ike dị oke egwu, maọbụ rụọ ọrụ dị oke egwu ụdị nke Mosis rụrụ nʼihu ndị Izrel niile.
JOS 1:1 Mgbe Mosis, bụ odibo Onyenwe anyị nwụrụ, Onyenwe anyị gwara Joshua nwa Nun, onye na-enyere Mosis aka okwu sị,
JOS 1:2 “Mosis, odibo m anwụọla. Ugbu a, jikere onwe gị, meekwa ka ndị m jikere ịgafe ofe ọzọ nke osimiri Jọdan, ịbanye nʼala ahụ m na-aga inye ha, bụ ndị Izrel.
JOS 1:3 Ana m agwa gị ihe m gwara Mosis mgbe ọ dị ndụ sị, Ebe ọbụla unu ga-azọkwasị ụkwụ unu nʼala, ala ahụ ga-abụ nke unu.
JOS 1:4 Oke ala unu ga-abụ site nʼọzara dị na ndịda ruo Lebanọn, ma site nʼiyi ukwu Yufretis, tinyere ala niile nke ndị Het, ruo nʼosimiri ukwu ahụ dị nʼọdịda anyanwụ.
JOS 1:5 Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ iguzo imegide gị ụbọchị niile nke ndụ gị. Aga m anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis. Agaghị m ahapụ gị aka. Agaghị m agbakụtakwa gị azụ.
JOS 1:6 Dịrị ike, nweekwa ume, nʼihi na ị ga-abụ onye ga-edu ndị a iketa ala ahụ m ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha ochie.
JOS 1:7 “Naanị dịrị ike, nweekwa ume. Lezie anya ime ihe niile Mosis bụ odibo m nyere gị nʼiwu. Ewezugala onwe gị na ya gaa aka nri maọbụ aka ekpe, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma nʼebe ọbụla ị na-aga.
JOS 1:8 Esitela nʼọnụ gị wezuga ihe dị nʼAkwụkwọ Iwu a. Kama na-atụgharị uche gị na ya ehihie na abalị, ka i si otu a lezie anya imezu ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ ị ga-aba ụba, ihe ga-agakwara gị nke ọma.
JOS 1:9 Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.”
JOS 1:10 Mgbe ahụ, Joshua nyere ndịisi Izrel niile iwu sị ha,
JOS 1:11 “Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke na-enye unu.’ ”
JOS 1:12 Joshua kpọkọtara ndịisi ebo Ruben, na Gad, na ọkara ebo Manase, gwa ha okwu sị,
JOS 1:13 “Chetanụ iwu ahụ Mosis odibo Onyenwe anyị nyere unu, mgbe ọ sịrị, ‘Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu izuike. O nyekwala unu ala a.’
JOS 1:14 Kama ndị nwunye unu, na ụmụntakịrị unu, na anụ ụlọ unu, ga-anọ nʼala a dị nʼọwụwa anyanwụ nke Mosis nyere unu. Ma ndị agha unu, ndị jikeere ejike, ga-eduru ndị Izrel ndị ọzọ gafee osimiri Jọdan inyere ụmụnna ha aka,
JOS 1:15 tutu ruo mgbe Onyenwe anyị Chineke unu nyere ha izuike, dịka o si nye unu, na tutu ruo mgbe ha nwetara ala niile bụ nke Onyenwe anyị Chineke unu ga-enye ha. Mgbe nke a mezuru, unu ga-alaghachi azụ, nweta ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan.”
JOS 1:16 Mgbe ahụ, ha zara Joshua, “Ihe ọbụla nke ị nyere anyị nʼiwu anyị ga-eme ha, ebe ọbụla i zigara anyị ka anyị ga-aga.
JOS 1:17 Anyị ga-ege gị ntị dịka anyị si gee Mosis ntị. Ka Onyenwe anyị Chineke gị nọnyere gị dịka o si nọnyere Mosis.
JOS 1:18 Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu i nyere anyị, ọ ga-anwụ. Naanị dịrị ike, nweekwa obi ike.”
JOS 2:1 Joshua nwa Nun sitere na Shitim zipụ ndị nnyopụta abụọ na nzuzo sị ha, “Gaanụ leta otu ihe si aga nʼala ahụ, karịsịa nʼobodo Jeriko.” Ha gara nʼobodo ahụ baa nʼụlọ nwanyị akwụna aha ya bụ Rehab nọọ ọnọdụ nʼebe ahụ.
JOS 2:2 Ma otu onye gwara eze Jeriko okwu sị, “Lee, ụfọdụ ụmụ ndị ikom Izrel batara obodo a nʼabalị inyochapụta ala anyị.”
JOS 2:3 Mgbe eze Jeriko nụrụ okwu a, o zigaara Rehab ozi sị, “Kpọpụta ndị ikom ahụ batara nʼụlọ gị nʼihi na ha bịara iledo ala anyị.”
JOS 2:4 Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa.
JOS 2:5 Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.”
JOS 2:6 (Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.)
JOS 2:7 Ya mere, ndị ikom ahụ pụrụ na-achụ ndị nnyopụta ahụ nʼakụkụ ụzọ gara ngabiga Jọdan. Ma ngwangwa ha pụrụ, e mechiri ọnụ ụzọ ama e si abata obodo ahụ.
JOS 2:8 Ma tupu ndị nnyopụta ahụ edina ala ịrahụ ụra nʼabalị ahụ, Rehab rịgokwuru ha,
JOS 2:9 gwa ha sị, “Ama m na Onyenwe anyị enyela unu ala a, marakwa na oke ụjọ nke egwu unu adakwasịla anyị, nke mere na ndị niile bi nʼime ala a na-agbaze nʼegwu nʼihi unu,
JOS 2:10 nʼihi na anyị anụla otu Onyenwe anyị si mee ka mmiri dị nʼOsimiri Uhie taa nʼihi unu, mgbe unu si nʼIjipt pụta. Anyị nụkwara ihe unu mere Saịhọn, na Ọg, bụ eze abụọ ndị Amọrị, ndị bi nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, otu unu si bibie ha, gbuchapụ ndị niile bi nʼala ahụ.
JOS 2:11 Ma mgbe anyị nụrụ ihe ndị a, obi anyị gbazere nʼihi ụjọ, mmụọ onye ọbụla dara mba nʼihi unu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa.
JOS 2:12 “Ugbu a, ebe ọ bụ na m emeelara unu ebere, jirinụ Onyenwe anyị ṅụọrọ m iyi na unu ga-emere ezinaụlọ m ebere. Gosinụ m ihe ịrịbama nʼeziokwu,
JOS 2:13 na unu ga-emekwa ka ndụ nna m, na nne m, na ụmụnne m ndị ikom na ndị inyom, na ndị ezinaụlọ ha niile dịrị, na unu ga-anapụta anyị site nʼọnwụ.”
JOS 2:14 Ndị ikom ahụ kwere ya nkwa sị, “Ndụ anyị lara ndụ unu. Ọ bụrụ na ị gbaghị anyị ama, anyị ga-egosi gị obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi mgbe Onyenwe anyị ga-enye anyị ala a.”
JOS 2:15 Ụlọ Rehab dị nʼakụkụ mgbidi obodo ahụ. O ji ụdọ site na oghereikuku wedata ndị ikom abụọ ahụ.
JOS 2:16 Ọ gwakwara ha sị, “Gbalaganụ nʼugwu, zoonụ onwe unu nʼebe ahụ ụbọchị atọ, tutu ndị ahụ na-achọ unu alaghachi azụ. Mgbe ahụ, unu nwere ike ịpụta laghachi ebe unu si bịa.”
JOS 2:17 Ndị ahụ gwara ya sị, “Iyi a i mere ka anyị ṅụọ agaghị adị ire megide anyị,
JOS 2:18 ma ọ bụrụ na nʼụbọchị ahụ anyị ga-abata ala a, i wereghị ụdọ ahụ na-acha uhie uhie kenye ya na oghereikuku i si wedata anyị, ma ọ bụrụkwa na ịkpọbataghị nʼụlọ gị nna gị, na nne gị, na ụmụnne gị ndị ikom, na ndị ezinaụlọ gị niile.
JOS 2:19 Ọ bụrụ na onye ọbụla esite nʼụlọ gị pụọ nʼezi, ọbara ya agaghị adị anyị nʼisi, anyị agaghị abụkwa ndị ikpe mara. Ma ikpe ọmụma dịrị anyị ma ọ bụrụ nʼihe ọbụla emee onye ọbụla gị na ya so nọdụ nʼime ụlọ.
JOS 2:20 Ma ọ bụrụ na ị gbaa anyị ama, ọ dịkwaghị iwu ji anyị imezu iyi a i mere ka anyị ṅụọrọ gị.”
JOS 2:21 Rehab zara sị ha, “Dịka okwu niile unu kwuru si dị, otu a ka ọ ga-adị.” O zilagara ha. Ha pụkwara gaara onwe ha. Ma Rehab kekwasịrị ụdọ uhie uhie ahụ nʼọnụ oghereikuku ụlọ ya.
JOS 2:22 Ndị ikom abụọ ahụ gara zoo onwe ha nʼugwu ahụ. Ha nọrọ ụbọchị atọ nʼebe ahụ dịka Rehab gwara ha, tutu ndị ahụ na-achụ ha laghachiri nʼobodo Jeriko. Ndị a chọọrọ ha gaa ebe niile, nʼokporoụzọ niile, ma ha ahụghị ha.
JOS 2:23 Emesịa, mmadụ abụọ ahụ e zipụrụ iledo ala ahụ anya sitere nʼebe ha zoro onwe ha rịpụta, gafee osimiri Jọdan, laghachi nʼebe ụmụ Izrel nọ. Ha bịara kọọrọ Joshua nwa Nun otu ha si gaa ije ha.
JOS 2:24 Ha gwara Joshua sị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyela anyị ala ahụ niile, nʼihi na ndị niile bi nʼala ahụ na-atụ anyị ụjọ.”
JOS 3:1 Nʼisi ụtụtụ, Joshua na ụmụ Izrel niile hapụrụ Shitim bịaruo nʼakụkụ osimiri Jọdan, maa ụlọ ikwu nʼebe ahụ. Nʼebe a ka ha nọ chere tutu ruo mgbe ha ga-agafe.
JOS 3:2 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ndịisi ụmụ Izrel gabigara jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ahụ,
JOS 3:3 nye ha iwu sị, “Mgbe unu hụrụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ndị nchụaja, ụmụ Livayị, bulitere ya, unu onwe unu ga-esi nʼebe unu nọ bilie soro ha nʼazụ.
JOS 3:4 Ma a ga-enwe oke nʼetiti unu na ha, ihe dịka otu kilomita site nʼebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị. Unu agaghị abịaru ya nso. Nke a bụ maka ị mara ụzọ unu ga-eso, nʼihi na unu esibeghị nʼụzọ a gaa ije mbụ.”
JOS 3:5 Joshua gwara ndị Izrel sị, “Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na echi ka Onyenwe anyị ga-eme oke ihe ebube dị iche iche nʼetiti unu.”
JOS 3:6 Joshua gwara ndị nchụaja sị ha, “Bulienụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, gabiga nʼihu ndị Izrel.” Ha buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bido ịga nʼihu ụmụ Izrel.
JOS 3:7 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị.
JOS 3:8 Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’ ”
JOS 3:9 Mgbe ahụ, Joshua gwara ụmụ Izrel niile sị, “Bịanụ nso, bịanụ nụrụ okwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu.
JOS 3:10 Otu a ka unu ga-esi mata nʼezie na Chineke dị ndụ nọ nʼetiti unu, unu ga-amatakwa na ọ ghaghị ịnapụ ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Hiv, na ndị Periz, na ndị Gigash, na ndị Amọrait, na ndị Jebus ala ha nʼihu unu.
JOS 3:11 Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile ga-agabiga nʼihu unu banye nʼime Jọdan.
JOS 3:12 Ugbu a sitenụ nʼebo Izrel niile họpụta ndị ikom iri na abụọ, site nʼebo ọbụla otu onye.
JOS 3:13 Ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile zọnyere ụkwụ na Jọdan, mmiri Jọdan nke si nʼebe elu ya na-arịdata ga-akwụsị ịsọ, guzoro dịka mgbidi.”
JOS 3:14 Ya mere, mgbe ndị Izrel sitere nʼụlọ ikwu ha bilie njem ịgabiga osimiri Jọdan, ndị nchụaja bụ igbe ọgbụgba ndụ buuru ha ụzọ na-aga ha nʼihu.
JOS 3:15 Nʼoge owuwe ihe ubi ọbụla, osimiri Jọdan na-etoju etoju, sọjukwaa akụkụ ya niile. Ma ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ a bịaruru nso zọnye ụkwụ ha nʼọnụ mmiri Jọdan,
JOS 3:16 mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko.
JOS 3:17 Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.
JOS 4:1 Mgbe mba ahụ niile gafesịrị osimiri Jọdan, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya,
JOS 4:2 “Site nʼetiti ndị ụmụ Izrel họpụta ndị ikom iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla,
JOS 4:3 ka onye ọbụla nʼime ha site nʼebe ahụ ndị nchụaja guzoro nʼetiti osimiri Jọdan buputa otu nkume, otu nkume, gwa ha ka ha debe nkume ndị a ha buputara nʼebe unu ga-anọ ọnọdụ abalị taa.”
JOS 4:4 Ya mere, Joshua kpọrọ ndị ikom iri na abụọ ndị ahụ, ndị ọ họpụtara, site nʼetiti ndị Izrel, otu onye site nʼebo ọbụla,
JOS 4:5 Ọ gwara ha sị, “Sitenụ nʼetiti osimiri Jọdan, ebe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu guzoro, buputa nkume. Onye ọbụla nʼime unu ga-ebuputa otu nkume, tụkwasị nʼubu ya, dịka ọnụọgụgụ ebo Izrel niile si dị,
JOS 4:6 ka ha bụrụ ihe ịrịbama nʼetiti unu. Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị bụ isi ogidi nkume a dị nʼebe a?’
JOS 4:7 Unu ga-asịkwa ha, ‘Ọ bụ ihe na-echetara anyị otu osimiri Jọdan si kwụsị ịsọ, mgbe ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị zọnyere ụkwụ ha nʼosimiri ahụ.’ Nkume a ga-abụkwara ụmụ Izrel niile ihe ncheta ruo mgbe ebighị ebi.”
JOS 4:8 Ụmụ Izrel mere dịka Joshua gwara ha. Ha buputara nkume iri na abụọ site nʼetiti osimiri Jọdan, dịka Onyenwe anyị si nye Joshua nʼiwu sị na otu onye, nʼebo Izrel ọbụla, ga-ebuputa otu nkume. Ha buuru nkume iri na abụọ ndị ahụ gaa nʼebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, debe ha nʼebe ahụ.
JOS 4:9 Joshua nʼonwe ya kwa ji nkume iri na abụọ ahụ nke si nʼetiti osimiri Jọdan wuo ogidi ịrịbama, nʼebe ahụ ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ guzoro. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
JOS 4:10 Ndị nchụaja, ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, guzoro nʼetiti osimiri Jọdan, tutu ruo mgbe e mezuru iwu ahụ niile Onyenwe anyị nyere Joshua site nʼọnụ Mosis. Mgbe ahụ kwa, ndị Izrel mere ngwangwa gafee osimiri Jọdan.
JOS 4:11 Ngwangwa ha niile gafetasịrị, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na ndị nchụaja gafetakwara nʼakụkụ nke ọzọ, ka ndị mmadụ na-ele ha anya.
JOS 4:12 Ndị agha ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase, buuru ụmụ Izrel niile ụzọ gafee, idu ha nʼagha, dịka Mosis nyere ha nʼiwu.
JOS 4:13 Ndị agha ọnụọgụgụ ha ruru iri puku anọ (40,000), ndị jikeere nke ọma ibu agha, duuru ebo ndị ọzọ, gafere nʼihu Onyenwe anyị bata nʼobosara ala Jeriko maka ibu agha.
JOS 4:14 Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Onyenwe anyị buliri Joshua elu nke ukwuu nʼihi na o mere Joshua ka ọ dị ukwuu nʼanya ndị Izrel niile, si otu a mee ka ha tụọ ya egwu nke ukwuu dịka ha si tụọ Mosis egwu, ma sọpụkwara ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
JOS 4:15 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị,
JOS 4:16 “Nye ndị nchụaja, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ iwu ka ha si nʼosimiri Jọdan pụta.”
JOS 4:17 Ya mere Joshua nyere ndị nchụaja iwu sị ha, “Sitenụ nʼosimiri Jọdan pụta.”
JOS 4:18 Mgbe ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ si nʼosimiri Jọdan rịpụta, dịka ọbụ ụkwụ ha na-emetụ nʼala akọrọ, mmiri osimiri ahụ sọghachiri nʼọnọdụ ya ruchie akụkụ ya niile, ka ọ dị na mbụ.
JOS 4:19 Ihe ịrịbama a mere nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke mbụ. Nʼụbọchị ahụ ka ndị Izrel niile gafere osimiri Jọdan, gaa maa ụlọ ikwu ha na Gilgal, ebe dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Jeriko.
JOS 4:20 Nkume iri na abụọ ahụ ha si nʼosimiri Jọdan buputa, ka Joshua guzobere na Gilgal.
JOS 4:21 Ọ sịrị ndị Izrel, “Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ ndị bụ nna ha ajụjụ sị, ‘Gịnị ka nkume ndị a pụtara, Gịnịkwa ka ha na-egosi?’
JOS 4:22 Gwa ha, ‘Izrel gafere osimiri Jọdan nʼala akọrọ.’
JOS 4:23 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. Onyenwe anyị Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ.
JOS 4:24 O mere ihe ndị a niile ka ndị niile bi nʼelu ụwa mata na aka Onyenwe anyị dị ike. O mekwara ya ka unu onwe unu tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe niile.”
JOS 5:1 Mgbe ndị eze ndị Amọrait niile, ndị bi nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, na ndị eze ndị Kenan niile bi nʼakụkụ oke osimiri Mediterenịa, nụrụ na Onyenwe anyị emeela ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu ụmụ Izrel, ruo mgbe anyị niile gafesịrị, obi lọrọ ha mmiri. Ọ dịkwaghị ike ọbụla fọdụụrụ ha iguzo nʼihu ụmụ Izrel.
JOS 5:2 Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Jiri nkume mee mma ị ga-eji bie ụmụ Izrel niile ugwu ọzọ.”
JOS 5:3 Ya mere, Joshua ji nkume mee mma ntakịrị e ji bie ụmụ Izrel niile ugwu. Ebe a nọ bie ụmụ Izrel ugwu bụ ebe a na-akpọ Gibịat Haaralot.
JOS 5:4 Nke a bụ ihe mere o ji mee otu a: Ndị ikom niile si nʼIjipt pụta, ndị tozuru ije agha, nwụrụ nʼụzọ, nʼime ọzara, mgbe ha hapụchara Ijipt.
JOS 5:5 Mgbe ụmụ Izrel niile si Ijipt pụta, e biri ndị nwoke niile nọ nʼetiti ha ugwu. Ma nʼime iri afọ anọ ahụ ha na-awagharị nʼọzara, o nweghị ụmụ ha ndị nwoke a mụrụ nʼoge a e biri ugwu.
JOS 5:6 Ndị Izrel niile awagharịala nʼọzara iri afọ anọ tutu ruo mgbe ndị ikom niile toruru ije agha, bụ ndị hapụrụ Ijipt nwụchara, ebe ọ bụ na ha jụrụ irubere Onyenwe anyị isi. Nʼihi na Onyenwe anyị ṅụrụ iyi sị ha na ha agaghị ahụ ala ahụ anya, bụ ala ahụ o kwere nna nna ha na nkwa, inye anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
JOS 5:7 Onyenwe anyị mere ka ụmụ ndị nnupu isi a mụtara nọchie anya ha. Ọ bụkwa ndị a ka Joshua biri ugwu, nʼihi na tutu ruo ugbu a, e bibeghị ha ugwu.
JOS 5:8 Mgbe e bizuru mba niile ahụ ugwu, ha nọdụrụ nʼebe ahụ ha mara ụlọ ikwu tutu ọnya obibi ugwu ha alaa.
JOS 5:9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị, “Taa, ewezugala m site nʼebe unu nọ ihe nkọcha nke ya na Ijipt so.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Gilgal. Ọ bụkwa aha ya ruo taa.
JOS 5:10 Mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal nʼala ihe nʼadịghị nke Jeriko, ha mere Mmemme Ngabiga nʼuhuruchi nke ụbọchị iri na anọ nke ọnwa ahụ.
JOS 5:11 Nʼụbọchị sotere ụbọchị ngabiga, nʼotu ụbọchị ahụ, ha riri ụfọdụ ihe ubi nke ala Kenan. Ọ bụ achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na ọka ahụrụ nʼọkụ ka ha tara.
JOS 5:12 Mánà kwụsịkwara nʼechi ya mgbe ha riri nri sitere nʼala ahụ. Ụmụ Izrel ahụkwaghị mánà anya ọzọ, ma nʼafọ ahụ ha riri ihe omume ubi si nʼala Kenan.
JOS 5:13 Mgbe Joshua nọ nso obodo Jeriko, o weliri anya ya elu hụ otu nwoke ka o guzo nʼihu ya. Nwoke a mịpụtara mma agha ya jide ya nʼaka ya. Joshua jekwuru ya jụọ ya sị ya, “Ị dịnyeere anyị ka ị dịnyeere ndị iro anyị?”
JOS 5:14 Nwoke ahụ zaghachiri ya sị, “Ọ dịghị onye m dịnyeere, kama abịara m ugbu a dịka ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị.” Joshua dara nʼala kpuo ihu ya nʼala kpọọ isiala nye ya, sị ya, “Ejikerela m ime ihe ọbụla i nyere nʼiwu. Onyenwe m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?”
JOS 5:15 Ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị zara sị Joshua, “Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.” Joshua mere dịka ọ gwara ya.
JOS 6:1 Ma e mechiri ọnụ ụzọ e si abata Jeriko nke ọma, nʼihi ụmụ Izrel. Ọ dịghị onye ọbụla na-apụ nʼezi, ọ dịghịkwa onye na-abata nʼime ya.
JOS 6:2 Ma Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Lee, enyefela m obodo a bụ Jeriko, ya na eze ya, na ndị dị ike ibu agha nọ nʼime ya, nʼaka gị.
JOS 6:3 Gị na ndị agha gị zọọnụ ije gburugburu obodo a. Unu ga-ejegharị gburugburu mgbidi obodo a otu ugbo nʼụbọchị. Unu ga-esi otu a jegharịa ụbọchị isii.
JOS 6:4 Ndị nchụaja asaa, ndị ga-eji opi mpi ebule asaa ga-ebu ụzọ gawa nʼihu. Ndị nchụaja ndị ọzọ ga-ebu igbe ọgbụgba ndụ. Nʼụbọchị nke asaa, unu ga-agba obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Mgbe unu na-eme nke a, ndị nchụaja asaa ahụ ga na-afụ opi mpi ebule ha.
JOS 6:5 Emesịa, ndị nchụaja ga-afụsi opi ahụ ike otu ugbo ọzọ, ha ga-afụ ya ka ọ daa ụda nke ukwu. Mgbe mmadụ niile nụrụ ụda opi a, ha niile ga-eti mkpu nke ga-ada ezi ụda. Nke a ga-eme ka mgbidi obodo ahụ daa. Mgbe ahụ, onye agha ọbụla ga-esite nʼebe ọbụla ọ nọ banye nʼime obodo ahụ.”
JOS 6:6 Ya mere, Joshua nwa Nun kpọrọ ndị nchụaja sị ha, “Burunu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, ka ndị nchụaja asaa nʼime unu werekwa opi mpi ebule buru ụzọ na-aga nʼihu ya.”
JOS 6:7 Mgbe ahụ Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Zọlịenụ ije! Gbaanụ obodo a gburugburu, ka ndị agha na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.”
JOS 6:8 Mgbe Joshua gwachara ndị Izrel okwu, ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike nʼaka ha, nʼihu Onyenwe anyị, gafere nʼihu na-afụ opi ike ha. Ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị sochiri ha azụ.
JOS 6:9 Ndị agha na-aga nʼihu ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi ike, ebe ndị agha ndị ọzọ na-esote igbe ọgbụgba ndụ nʼazụ. Nʼoge a niile ha na-azọ ije, ndị na-afụ opi ike gara nʼihu na-eme nke a.
JOS 6:10 Ma Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Unu emela mkpọtụ agha ọbụla, maọbụ kwee ka anụ olu unu, maọbụ kwuo okwu ọbụla, tutu ruo ụbọchị m ga-asị unu tie mkpu. Mgbe m nyere unu iwu a, tienụ ezi mkpu.”
JOS 6:11 Ya mere, e buuru igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ jegharịa obodo ahụ gburugburu otu ugboro nʼụbọchị ahụ. Mgbe ha mesịrị nke a, onye ọbụla laghachiri nʼebe ụlọ ikwu ya dị rahụ ụra abalị.
JOS 6:12 Joshua biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị nchụaja bulikwara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
JOS 6:13 Ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike asaa ndị ahụ, na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na-afụ opi ike ha na-esepụghị aka. Ndị agha nọ nʼihu ha, ebe ndị nche na-eso ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nʼazụ, nʼoge niile a a na-afụ opi ike ndị a na-esepụghị aka.
JOS 6:14 Nʼụbọchị nke abụọ, ha gbara obodo ahụ gburugburu otu ugboro, laghachikwa nʼụlọ ikwu ha. Otu a ka ha mere ruo nʼụbọchị nke isii.
JOS 6:15 Ma nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke asaa, ha bilitere mgbe chi na-abọbeghị, gbaa obodo ahụ gburugburu ugboro asaa dịka ha na-eme. Ma ọ dị iche nʼụbọchị ahụ, bụ naanị na ha gbara obodo ahụ gburugburu ugboro asaa.
JOS 6:16 O ruo, nʼoge njegharị nke ugboro asaa ahụ, mgbe ndị nchụaja asaa ndị a fụsiri opi ike asaa ndị ahụ ike karịa, ka Joshua gwara ndị Izrel sị ha, “Tienụ mkpu! Nʼihi na Onyenwe anyị enyela unu obodo a!
JOS 6:17 Gbuonụ ihe niile na-eku ume ndụ, nʼihi na obodo a na ihe niile dị nʼime ha bụ ihe e doro nsọ nye Onyenwe anyị. Ma ọ bụ naanị Rehab, nwanyị akwụna ahụ ka unu ga-ahapụ ndụ, ya na ndị ọbụla nọ nʼụlọ ya. Nʼihi na o zoro ndị anyị zigara inyochapụta obodo ahụ.
JOS 6:18 Ma unu onwe unu, wezuganụ onwe unu pụọ nʼebe ihe ndị a kwadoro mbibi dị, ka unu gharakwa iweta ịla nʼiyi nye onwe unu site na iwere ihe ọbụla nʼime ha. Ma ọ bụghị otu a, unu ga-eme ka mbibi dakwasị ụlọ ikwu ụmụ Izrel niile.
JOS 6:19 Ma ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, ka a ga-edo iche nye Onyenwe anyị. A ga-ewebata ha nʼụlọakụ Onyenwe anyị.”
JOS 6:20 Mgbe ụda opi ike ahụ dasiri ike, ndị agha tiri mkpu, na ụda opi ike ahụ. Mgbe ndị ikom tiri oke mkpu, mgbidi ahụ dara dapịasịa, nke mere na onye ọbụla chere ihu banye nʼime obodo ahụ, lụgbuo obodo ahụ.
JOS 6:21 Ha debere obodo a iche nye Onyenwe anyị site nʼiji mma agha ha gbuchapụ ihe niile dị ndụ nʼobodo ahụ, ma nwoke, ma nwanyị, ma nwantakịrị, ma okenye, ma ehi, ma atụrụ, ma ịnyịnya ibu, ihe niile dị nʼime ya.
JOS 6:22 Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị ikom abụọ ahụ buru ụzọ gaa nnyochapụta obodo ahụ anya sị ha, “Mezuonụ nkwa unu kwere. Gaanụ nʼụlọ nwanyị akwụna, kpọpụta ya na ndị niile dị nʼụlọ ya.”
JOS 6:23 Ya mere, ụmụ okorobịa abụọ ahụ bụ ndị mere nledo ala ahụ, bara nʼụlọ ahụ, kpọpụta Rehab na nna ya na nne ya na ụmụnne ya na ndị ikwu ya niile. Ha kpọpụtara ndị ezinaụlọ ya niile debe ha nʼotu ebe nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel.
JOS 6:24 Ha kpọrọ obodo ahụ ọkụ, ya na ihe niile dị nʼime ya. Ma ha wepụtara naanị ọlaọcha na ọlaedo, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, tinye nʼụlọakụ Onyenwe anyị.
JOS 6:25 Joshua mere ka Rehab, nwanyị akwụna ahụ, na ndị ezinaụlọ ya niile dịrị ndụ. Nʼihi na Rehab zoro ndị ikom abụọ Joshua zigara, mee ka ha dị ndụ, bụ ndị gara inyochapụta obodo Jeriko. Ya mere, o binyere ndị Izrel ruo taa.
JOS 6:26 Mgbe ahụ, Joshua gbara obodo Jeriko iyi sị, “Ọbụbụ ọnụ ka a na-abụ nwoke ọbụla nʼihu Onyenwe anyị nke ga-ebili wuokwa obodo Jeriko ọzọ. “Ndụ ọkpara ya ka ọ ga-eji tọọ ntọala ya niile, ndụ nwa ya nke nta, ka ọ ga-eji guzobe ọnụ ụzọ ama ya niile ọtọ.”
JOS 6:27 Ya mere, Onyenwe anyị nọnyeere Joshua. Akụkọ a kọrọ banyere ya gbasara nke ukwuu nʼala ahụ niile.
JOS 7:1 Ma ụmụ Izrel ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe gbasara ihe ndị ahụ e debere iche nye Onyenwe anyị. Nʼihi na Ekan nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera, onye si nʼebo Juda gara were ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị nke ukwuu megide ụmụ Izrel.
JOS 7:2 Emesịa, Joshua si Jeriko zipụ ụfọdụ ndị mmadụ ka ha gaa Ai, obodo dị Bet-Aven nso, nʼọwụwa anyanwụ Betel. Ọ gwara ha sị ha, “Gaanụ nnyopụta akụkụ ala ahụ niile.” Ya mere, ndị ahụ gara nnyochapụta obodo Ai.
JOS 7:3 Mgbe ha lọghachiri azụ, ha gwara Joshua sị ya, “Ai bụ obodo nta. Ọ gaghị ewe karịa puku mmadụ abụọ maọbụ atọ imeri obodo ahụ. Ọ bakwaghị uru ka anyị niile gaa tigbuo obodo a, nʼihi na ha dị mmadụ ole na ole.”
JOS 7:4 Nʼihi nke a, ihe dịka puku ndị agha atọ ka e zigara imeri obodo Ai. Ma ngwangwa, ndị agha obodo Ai meriri ndị agha ụmụ Izrel, chụọ ha ọsọ.
JOS 7:5 Ihe dịka iri mmadụ atọ na isii nʼetiti ndị agha Izrel ka e gburu nʼagha ahụ. Ndị Ai chụrụ ha ọsọ site nʼụzọ ama obodo ruo nʼebe a na-awa nkume, gbuo ha na mgbada ugwu ahụ. Nʼihi nke a, ndị agha Izrel dara mba, obi lọkwara ha mmiri.
JOS 7:6 Mgbe ahụ, Joshua na ndị okenye Izrel sitere nʼobi mwute dọwaa uwe ha, daa nʼala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha wekwara ntụ wụkwasị onwe ha nʼisi igosi obi mwute ha.
JOS 7:7 Mgbe ahụ kwa, Joshua sịrị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Nʼihi gịnị ka i ji mee ka ndị a gabiga osimiri Jọdan, inyefe anyị nʼaka ndị Amọrait, ime ka ha tigbuo anyị? Ọ gaara adị anyị mma nke ọma ma ọ bụrụ na anyị nọdụrụ nʼofe ọzọ nke Jọdan.
JOS 7:8 Biko, Onyenwe m, Gịnị ka m ga-ekwu ugbu a ụmụ Izrel sitere nʼihu ndị iro ha gbaa ọsọ?
JOS 7:9 Nʼihi na mgbe ndị Kenan na ndị bi nʼakụkụ ala ahụ ga-anụ maka mmeri e meriri anyị, ha ga-agba anyị gburugburu lụso anyị agha, bipụ aha anyị nʼụwa. Ọ bụkwa gịnị ka ị ga-eme banyere aha ukwu gị dị ebube?”
JOS 7:10 Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Bilie ọtọ! Gịnị bụ nke a, na ị dara kpuo ihu nʼala?
JOS 7:11 Izrel emehiela. Ha emebiela ọgbụgba ndụ m nyere ha nʼiwu idebe, ha ewerela ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ e doro iche nye Onyenwe anyị. Ọ bụghị naanị na ha zuru ohi, ha nọkwa nʼelu ya ghaa ụgha banyere ya. Ha ewerekwala ihe ndị ahụ tinyekọta nʼihe nke aka ha.
JOS 7:12 Ọ bụ nʼihi nke a mere na ụmụ Izrel enwekwaghị ike iguzo nʼihu ndị iro ha. Ọ bụkwa nke a mere ha ji tụgharịa gbaa ọsọ, nʼihi na ha aghọọla ndị kwesiri ka e bibie. Ya mere, agaghị m anọnyere unu ọzọ, tutu ruo mgbe unu wezugara ma mebie site nʼetiti onwe unu, ihe ọbụla e debere iche maka mbibi.
JOS 7:13 “Bilie! Doo Izrel nsọ. Gwa ndị m okwu sị ha, ‘Onye ọbụla nʼetiti unu ga-ejikere doo onwe ya nsọ maka echi. Nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu sị, Ihe ndị e doro nsọ dị nʼetiti unu, Izrel. Unu apụghịkwa iguzosi ike nʼihu ndị iro unu, tutu ruo mgbe unu ga-esite nʼetiti onwe unu wezuga ihe ndị ahụ.’
JOS 7:14 “ ‘Nʼụtụtụ echi, unu ga-apụta nʼebo nʼebo. Ebo ọbụla Onyenwe anyị họpụtara ga-apụta nʼikwu nʼikwu, ikwu ọbụla Onyenwe anyị họpụtara ga-apụta bịa nʼezinaụlọ nʼezinaụlọ, ụlọ ọbụla nke Onyenwe anyị họọrọ, ndị ikom ya ga-apụta nʼotu nʼotu.
JOS 7:15 Ma onye ọbụla e jidere ji ihe ndị ahụ e doro nsọ ka a ga-akpọ ọkụ, ya onwe ya, na ihe niile ọ nwere, nʼihi o mebiela iwu ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, meekwa ihe jọgburu onwe ya na njọ nʼIzrel.’ ”
JOS 7:16 Nʼihi nke a, Joshua biliri nʼisi ụtụtụ. O mere ka ebo niile dị nʼIzrel bịaruo nso nʼebo nʼebo, ebo Juda ka a họọrọ.
JOS 7:17 Mgbe ahụ, e mere ka ikwu niile dị nʼebo Juda bịaruo nso, ikwu Zera ka ahọpụtara. Mgbe e mere ka ikwu Zera pụta nʼezinaụlọ ha niile nʼotu nʼotu, ezinaụlọ Zimri bụ nke ahọpụtara.
JOS 7:18 Joshua mere ka ndị ikom niile dị nʼezinaụlọ Zimri pụta nʼotu nʼotu, ma e jidere Ekan, nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera onye ebo Juda.
JOS 7:19 Mgbe ahụ, Joshua sịrị Ekan, “Nwa m, nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel otuto, nyekwa ya nsọpụrụ. Gwa m ihe i mere. Ezonarịkwala m ihe ọjọọ i mere.”
JOS 7:20 Mgbe ahụ, Ekan zara Joshua sị ya, “Ọ bụ eziokwu! Emehiela m megide Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Lee ihe m mere.
JOS 7:21 Mgbe m hụrụ nʼetiti ihe ndị a kwatara nʼagha, otu uwe mwụda Babilọn mara mma, na narị Shekel ọlaọcha abụọ, na mkpirisi ọlaedo ịdị arọ ya ruru iri shekel ise. E nwere m anya ukwu nʼebe ihe ndị a dị, chịrị ha. Lee, ezoro m ha nʼime ala nʼụlọ ikwu m, ọlaọcha ahụ dịkwa nʼokpuru ya.”
JOS 7:22 Ya mere, Joshua zigara ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa chọọ ihe ahụ Ekan zoro. Ndị a gara nʼụlọ ikwu ahụ, chọpụta ihe ahụ ezuru nʼohi. Dịka Ekan kwuru, ihe ikpeazụ ha hụrụ bụ ọlaọcha ahụ.
JOS 7:23 Ha chịkọtara ha niile chịtara ha Joshua. Mgbe ha bịaruru ebe Joshua na ndị Izrel niile nọ, ha chịsara ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị.
JOS 7:24 Mgbe ahụ, Joshua na ndị Izrel niile, duuru Ekan, nwa Zera, chịkọrọkwa ọlaọcha ahụ, na uwe mwụda ahụ, na mkpirisi ọlaedo ahụ, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, na ehi na ịnyịnya ibu ya, na igwe ewu na atụrụ ya, na ụlọ ikwu ya, na ihe niile o nwere, gaa na Ndagwurugwu Akọ.
JOS 7:25 Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Gịnị mere i ji wetara anyị nsogbu ndị a? Onyenwe anyị ga-eme ka nsogbu dakwasịkwa gị onwe gị taa.” Ndị Izrel niile weere nkume tugbuo ha nʼebe ahụ. Emesịa, a kpọrọ ha ọkụ.
JOS 7:26 Ha tụkọtara ọtụtụ nkume tụkwasị ya nʼelu Ekan. Nkume ndị a dị nʼebe ahụ ruo taa. Ọ bụkwa nʼụzọ dị otu a ka iwe ọkụ Onyenwe anyị ji dajụọ. Ya mere, e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Akọ ruo taa.
JOS 8:1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla egwu, adakwala mba. Chịrị ndị agha gị niile gaa Ai, nʼihi na ugbu a, unu onwe unu ga-emeri ha. Aga m eme ka i merie eze ndị Ai, na ndị ya na obodo ya, na ala ya.
JOS 8:2 Ị ga-emekwa obodo Ai na eze ya ihe i mere Jeriko na eze ya. Ma ihe dị iche na nke a bụ na unu ga-edebere onwe unu ihe niile unu kwatara nʼagha, ya bụ anụ ụlọ niile na ngwongwo obodo ahụ niile. Jikerenụ ibuso ha agha. Ọ bụkwa nʼazụ obodo ha ka unu ga-esi lụso ha agha.”
JOS 8:3 Mgbe ahụ, Joshua na ndị agha ya niile, biliri gaa ibuso Ai agha. Joshua họpụtara iri puku ndị agha atọ zipụ ha nʼabalị
JOS 8:4 o nyere ha iwu a, “Lee! Unu ga-aga zoo onwe unu nʼọhịa dị nʼazụ obodo Ai. Unu ezola onwe unu nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ, kama nọọnụ nso, nọọkwanụ na njikere.
JOS 8:5 Mụ na ndị niile so m ga-abịaru obodo ahụ nso. Mgbe ha ga-apụta ịlụso anyị ọgụ dịka ha mere na mbụ, anyị ga-agbakwa ọsọ nʼihu ha,
JOS 8:6 Ha ga-achụ anyị ọsọ, tutu ruo mgbe anyị mere ka ha niile hapụ nʼobodo ha pụta. Nʼihi nʼuche ha, ha ga-asị, ‘Ha na-agbara anyị ọsọ dịka ha mere na mbụ, bịanụ ka anyị chụọ ha ọsọ gbuo ha.’ Ya mere, dịka anyị na-agbapụ site nʼebe ha nọ,
JOS 8:7 unu ga-esite nʼebe unu zoro onwe unu bilie, nweta obodo ahụ, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ya nʼaka unu.
JOS 8:8 Mgbe unu weere obodo ahụ, unu ga-esunye obodo ahụ ọkụ. Meenụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Hụnụ na unu mezuru ihe ndị a m nyere unu nʼiwu.”
JOS 8:9 Mgbe Joshua nyesịrị ha iwu ndị a, o zipụrụ ha. Ha hapụkwara nʼabalị ahụ gaa zoo onwe ha nʼọhịa dị nʼetiti Betel na ọdịda anyanwụ Ai. Ma Joshua na ndị agha ndị ọzọ fọdụrụ nọdụrụ nʼabalị ahụ nʼetiti ndị Izrel.
JOS 8:10 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Joshua chịkọtara ndị agha ya, ya na ndị ndu Izrel gara nʼihu ha, ruo Ai.
JOS 8:11 Ndị agha niile ha na ya so, chere ihu ha gaa nso obodo ruo nʼihu ya. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu obodo Ai, ndagwurugwu bụ ihe kewara ha na obodo ahụ.
JOS 8:12 Joshua chịịrị ihe ruru puku ndị agha ise, zoo ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ obodo ahụ, nʼetiti Betel na Ai.
JOS 8:13 Ya mere, ndị agha were ọnọdụ ha nʼusoro, ndị ga-ebu agha nọ nʼakụkụ ugwu, ndị niile zoro onwe ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo ahụ. Ma nʼabalị ahụ, Joshua gara nọdụ na ndagwurugwu ahụ.
JOS 8:14 Mgbe eze Ai hụrụ nke a, ya na ndị ikom obodo ahụ niile mere ngwangwa pụọ nʼisi ụtụtụ izute ndị Izrel nʼotu ebe, nke chere ihu nʼAraba. Ma ọ mataghị na o nwere ndị agha zubere imegide ya ndị zoro onwe ha nʼọhịa dị nʼazụ obodo.
JOS 8:15 Joshua na ndị Izrel niile mere ka ha chụghachi ha azụ site nʼihu ha, ha gbara ọsọ na-aga akụkụ ọzara ahụ niile dịka ndị e meriri emeri.
JOS 8:16 Nʼihi nke a, a kpọkuru ndị ikom niile nọ nʼime obodo Ai sị ha pụta bịa chụọ ụmụ Izrel ọsọ, ha chụrụ Joshua na-aga, e si otu a rapụta ha nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ.
JOS 8:17 Ọ dịkwaghị otu onye nwoke nke fọdụrụ na Ai maọbụ na Betel. Ha hapụkwara obodo ahụ ka o ghere oghe, gaa ịchụ ndị Izrel ọsọ.
JOS 8:18 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ Joshua sị ya, “Setịpụ ùbe dị gị nʼaka nʼụzọ Ai, nʼihi na aga m enye gị obodo a.” Joshua mere dịka Onyenwe anyị gwara ya.
JOS 8:19 Mgbe ndị agha ahụ zoro onwe ha nʼime ọhịa lere anya hụ na Joshua setịrị aka ya, ngwangwa, ha wụpụtara site nʼebe ha zoro onwe ha, gbara ọsọ gbaba nʼobodo Ai, merie ya, mụnye ya ọkụ.
JOS 8:20 Ma mgbe ndị agha Ai lere anya nʼazụ, hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo ha na-alali elu, ha dara mba nʼime onwe ha. Ohere ọbụla adịghịkwa nye ha ịgbalaga gaa otu ụzọ maọbụ ụzọ ọzọ. Nʼihi na ndị Izrel ahụ buuru ụzọ gbaa ọsọ, ndị ahụ gbara na-aga nʼọzara, chigharịrị bido ịlụso ndị agha Ai ahụ na-achụ ha ọsọ ọgụ.
JOS 8:21 Nʼihi na mgbe Joshua na ndị agha Izrel so ya lepụrụ anya hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo Ai na-arịgo elu, ha matara na ndị ha zoro onwe ha nʼọhịa abanyela obodo Ai, lụgbuo ya. Ya mere, Joshua na ndị agha so ya tụgharịrị bido igbu ndị agha obodo Ai.
JOS 8:22 Ndị agha Izrel ahụ gara kpọọ obodo ahụ ọkụ pụtakwara, site nʼobodo ahụ, bido ịlụso ndị agha Ai ọgụ. Nke a mere ka ndị agha Ai nọdụ nʼetiti ụzọ ndị agha Izrel abụọ. Otu nʼihu ha, ndị nke ọzọ nʼazụ ha. Ya mere, ndị agha Izrel menyụrụ ha anya, gbuo ha, ruo na ọ dịkwaghị otu onye fọdụrụ nʼime ha, maọbụ onye gbapụrụ agbapụ.
JOS 8:23 Naanị eze Ai ka e jidere na ndụ. A kpọtakwara ya bịaruo nʼebe Joshua nọ.
JOS 8:24 Mgbe ndị agha Izrel gbusịrị ndị agha Ai niile nọ nʼọhịa na nʼọzara, ha lọghachiri azụ gbuo ndị niile fọdụrụ nʼime obodo ahụ.
JOS 8:25 Ndị niile e gburu nʼụbọchị ahụ, ma nwoke ma nwanyị dị puku iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị niile nọ nʼobodo ahụ ka e gburu.
JOS 8:26 Nʼihi na Joshua nọgidere setịpụ ùbe o ji nʼaka ya, megide obodo Ai, tutu e bibie ndị niile nọ nʼobodo ahụ kpamkpam.
JOS 8:27 Ma ndị Izrel kwaara anụ ụlọ, na ihe nkwata nʼagha nke obodo ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Joshua nʼiwu si dị.
JOS 8:28 Ya mere, Joshua kpọrọ obodo Ai ọkụ, mee ya ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu ruo taa.
JOS 8:29 Ma Joshua kwụbara eze ndị Ai nʼelu osisi site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Mgbe anyanwụ dara, Joshua nyere iwu ka e wedata ozu eze Ai site nʼosisi ahụ, tụsa ya nʼihu ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Emesịa, ha tụkọtara ọtụtụ nkume nʼelu ya. Nkume ahụ ha tụkọtara dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
JOS 8:30 Mgbe ahụ, Joshua wuuru Onyenwe anyị, Chineke Izrel ebe ịchụ aja nʼelu ugwu Ebal,
JOS 8:31 dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ndị Izrel nʼiwu. O wuru ya dịka ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis si dị, ebe ịchụ aja a na-ejighị nkume a wara awa wuo, nkume a na-ejighị ngwa ọrụ igwe waa. Nʼelu ebe ịchụ aja a ka ha chụụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ na aja udo.
JOS 8:32 Ma mgbe ndị Izrel nọ na-ele anya, Joshua depụtara iwu ndị ahụ Mosis nyere ha nʼelu nkume.
JOS 8:33 Izrel niile, ha na ndị okenye ha, na ndị ọchịagha ha, na ndị ikpe ha, guzo nʼakụkụ abụọ nke igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na ncherita ihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị ndị na-ebu ya. Ma ndị ọbịa bi nʼetiti ha, ma ndị amụrụ nʼala ahụ nọ nʼebe ahụ. Ọkara nʼime ha gara guzo nʼakụkụ ugwu Gerizim, ọkara ndị ọzọ guzoro nʼakụkụ ugwu Ebal, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu na mbụ, na ha ga-agọzi ndị Izrel.
JOS 8:34 Emesịa, Joshua gụpụtara na ntị ha, okwu niile nke iwu ahụ, ya na ngọzị na ọbụbụ ọnụ so ya, dịka ihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu si dị.
JOS 8:35 Iwu niile Mosis nyere ha ka Joshua gụpụtara na ntị ndị Izrel niile. Ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa niile bi nʼetiti ụmụ Izrel so nọkọọ nʼoge a ndị Izrel niile zukọrọ.
JOS 9:1 Mgbe eze ndị niile bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan, nụrụ banyere ihe ndị a, ya bụ, ndị niile bi nʼala ugwu ugwu nʼọdịda anyanwụ ndagwurugwu, na ndị bi ogologo akụkụ osimiri Mediterenịa ruo Lebanọn, eze ndị Het na nke ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Periz na nke ndị Hiv na nke ndị Jebus,
JOS 9:2 ha niile zukọtara ibu agha megide Joshua na ụmụ Izrel.
JOS 9:3 Ma mgbe ndị Gibiọn nụrụ ihe Joshua mere Jeriko na Ai,
JOS 9:4 ha sitere nʼaghụghọ chọọ ụzọ ha ga-esi zọpụta onwe ha. Ha zipụrụ ndị ozi, ndị bokwasịrị ịnyịnya ibu ha akpa mere ochie, na karama akpụkpọ mere ochie, nke a duchiri ebe dị iche iche nʼahụ ha.
JOS 9:5 Ndị ahụ yikwasịrị nʼụkwụ ha akpụkpọụkwụ kara nka nke a kwachiri akwachi, na uwe mere nnọọ ochie. Achịcha niile ha ji bụ nri ha, kpọrọ nkụ maakwa ebu.
JOS 9:6 Mgbe ha bịaruru nʼebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal, ha jekwuuru Joshua, gwa ya na ndị Izrel okwu sị ha, “Anyị si nʼala dị anya bịa. Ugbu a, biko anyị chọrọ ka anyị na unu gbaa ndụ.”
JOS 9:7 Ndị ikom Izrel zaghachiri sị ndị Hiv ahụ, “Olee otu anyị si amata na unu ebighị anyị nso? Ma eleghị anya unu bi anyị nso, anyị na unu ọ ga-esi aṅaa gbaa ndụ?”
JOS 9:8 Ha zara Joshua sị ya, “Anyị bụ ndị ohu unu.” Ma Joshua jụrụ ha ajụjụ sị, “Olee ndị unu bụ? Ebee ka unu si bịa?”
JOS 9:9 Ha zara ya sị, “Ala anyị, ebe ndị ohu gị si bịa dị anya nke ukwuu. Anyị bịara nʼihi na anyị anụla akụkọ banyere Onyenwe anyị Chineke unu, na ihe niile o mere nʼIjipt.
JOS 9:10 Anyị anụkwala ihe niile o mere eze abụọ ndị Amọrait, ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, Saịhọn eze Heshbọn, na Ọg eze Bashan, onye chịrị nʼAshtarọt.
JOS 9:11 Ndị okenye anyị na ndị niile bi nʼala anyị sịrị anyị, ‘Werenụ ihe unu ji aga njem, jekwurunụ ndị Izrel sị ha, “Anyị bụ ndị ohu unu, kwerenụ ka anyị na unu gbaa ndụ.” ’
JOS 9:12 Lee achịcha ndị a bụ nke anyị ji mgbe anyị hapụrụ ala anyị. Ha dị ọkụ mgbe anyị hapụrụ ụlọ anyị ịbịa njem a, nʼihi na e si nʼebe a na-eghe ya wepụta ya, ma ugbu a, dịka unu hụrụ, ha akpọọla nkụ, bidokwa ịma ebu.
JOS 9:13 A gbajuru karama akpụkpọ anyị ndị a mmanya ọhụrụ mgbe anyị hapụrụ, ma ugbu a, karama ndị a adọwaala. Uwe anyị, na akpụkpọụkwụ anyị, emeela ochie nʼihi ịga ije dị anya.”
JOS 9:14 Ndị ikom Izrel ritụrụ ụfọdụ nʼime ihe oriri ha ji bịa, ma ha ajụtaghị ihe bụ uche Onyenwe anyị.
JOS 9:15 Mgbe ahụ, Joshua na ndị ahụ gbara ndụ udo ikwe ka ha dị ndụ. Ndịisi nzukọ Izrel mesiri ọgbụgba ndụ ahụ ike site nʼịṅụ iyi.
JOS 9:16 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site na mgbe ụmụ Izrel na ndị Gibiọn gbara ndụ, ndị Izrel nụrụ na ndị Gibiọn bụ ndị agbataobi ha, ndị bi ha nso.
JOS 9:17 Ya mere, ndị Izrel buliri ije gaa ịchọpụta ebe ndị a si bịa, si otu a bịaruo obodo ha niile nʼụbọchị nke atọ. Aha obodo ha bụ Gibiọn, Kefira, Beerọt na Kiriat Jearim.
JOS 9:18 Ma ndị Izrel ebusoghị ha agha nʼihi na ndịisi nzukọ Izrel ejirila aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel ṅụọ iyi idebe ha ndụ. Ma nzukọ Izrel niile tamuru ntamu megide ndịisi ha nʼihi ọgbụgba ndụ a.
JOS 9:19 Ma ndịisi Izrel kwuru sị, “Anyị aṅụọla iyi nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel sị, na anyị agaghị emetụ ha aka, ugbu a kwa anyị agaghị eme ha ihe ọbụla.
JOS 9:20 Ma nke a ka anyị ga-eme. Anyị ga-ekwe ka ha dị ndụ, nʼihi na ọ bụrụ na anyị emezughị iyi anyị ṅụrụ, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị anyị niile.”
JOS 9:21 Ya mere, ndịisi kwukwara sị, “Anyị ga-ahapụ ha ka ha dịrị ndụ, kama ha ga-aghọ ohu ndị Izrel, ndị ga na-awara anyị nkụ na ndị ga na-ekutere anyị mmiri.” Nʼụzọ dị otu a, e mere ka ha dịrị ndụ.
JOS 9:22 Emesịa, Joshua ziri ozi kpọọ ndịisi obodo Gibiọn jụọ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu ji ghọgbuo anyị site nʼịgwa anyị, ‘Anyị bi nʼebe dịpụrụ anya, site nʼebe unu bi,’ ebe ọ bụ na unu bi anyị nso?
JOS 9:23 Ugbu a, unu ga-abụ ndị a bụrụ ọnụ. Site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, unu aghọọla ndị ohu anyị, ndị ga na-awara anyị nkụ mgbe niile, na ndị ga na-ekutere anyị mmiri nke anyị ga-eji rụọ ọrụ nʼụlọnsọ Chineke m.”
JOS 9:24 Ha zara Joshua sị, “Anyị mere nke a nʼihi na agwala anyị na Onyenwe anyị Chineke gị nyere Mosis iwu sị ya merie ala ndị a niile, ma kpochapụ ndị niile bi nʼime ya. Ọ bụ nke a mere ụjọ ji tụọ anyị. Ọ bụkwa ya mere anyị ji mee ihe dị otu a, nʼihi ichebe ndụ anyị.
JOS 9:25 Ma ugbu a, anyị dị unu nʼaka. Unu nwere ike ime anyị ihe dị unu mma.”
JOS 9:26 Nʼihi nke a, Joshua ekweghị ka ndị Izrel gbuo ha.
JOS 9:27 Joshua mere ha ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri nye ụmụ Izrel, na ịhụkwa banyere ihe ndị dị mkpa nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Ọ bụkwa nke a ka ha bụ ruo taa.
JOS 10:1 Mgbe Adoni-Zedek, eze Jerusalem nụrụ na Joshua emeriela Ai, laa ya nʼiyi, gbukwaa eze ya, dịka ọ lara Jeriko na eze ya nʼiyi, mgbe ọ hụkwara na ndị Gibiọn na ndị Izrel emeela udo, na ha bikwa nso ndị Izrel,
JOS 10:2 ọ tụrụ egwu nke ukwuu, ya na ndị ya. Nʼihi na Gibiọn bụ obodo a ma ama, dịka otu nʼime obodo ndị eze, ndị ikom ya bụkwa ndị dị ike, nʼihi na ọ dịkwa ukwuu karịa Ai. Ndị ikom ya niile maara otu e si ebu agha.
JOS 10:3 Ya mere, Adoni-Zedek, eze Jerusalem ziri ozi zigara eze ndị a: Homa, eze Hebrọn, Piram, eze Jamut, Jafia, eze Lakish, na Debịa, eze Eglọn, na-asị,
JOS 10:4 “Bịanụ nyere m aka, ka anyị gaa tigbuo Gibiọn, nʼihi na ha na Joshua na ụmụ Izrel emeela udo.”
JOS 10:5 Mgbe ahụ, eze ise ndị Amọrait ndị a, eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish na eze Eglọn chịkọtara ndị agha. Ha na ndị agha ha gara were ọnọdụ ha imegide Gibiọn, ha lụsokwara ha ọgụ.
JOS 10:6 Ma ndị Gibiọn mere ngwangwa zigara Joshua ozi nʼụlọ ikwu dị na Gilgal sị ya, “Bịa nyere ndị ohu gị aka. Bịa ngwangwa zọpụta anyị, nʼihi na eze niile nke ndị Amọrait, ndị bi nʼugwu, abịala nʼebe a, ha na ndị agha ha ibuso anyị agha.”
JOS 10:7 Joshua na ndị agha ya niile, tinyere ndị ahụ niile ibu agha were anya, hapụrụ Gilgal gawa ịzọpụta Gibiọn.
JOS 10:8 Ma Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Atụla ha egwu! Nʼihi na ha bụ ndị e meriri emeri. Enyela m ha nʼaka unu ịla ha nʼiyi. Ọ dịkwaghị otu onye nʼetiti ha nwere ike iguzo nʼihu unu.”
JOS 10:9 Joshua bịakwutere ha na mberede, nʼihi na ogologo abalị niile ka o si Gilgal gaa njem.
JOS 10:10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tinyere ha nʼọnọdụ ọgbaaghara mgbe ha zutere ndị Izrel. Nke a mere ka ndị agha Izrel lụgbuo ha na Gibiọn. Nʼezie, ọnụọgụgụ ndị ha tigburu na Gibiọn dị nnọọ ukwuu. Ma ha chụkwara ndị fọdụrụ ọsọ chụruo ha Bet-Horon, na Azeka, na Makeda, na-egbu ha nʼụzọ.
JOS 10:11 Mgbe ha si nʼihu Izrel gbapụ ọsọ nʼụzọ nrịda Bet-Horon na-aga Azeka, Onyenwe anyị sitere nʼelu na-atụdakwasị ha ọtụtụ mkpụrụ mmiri. Ọnụọgụgụ ndị mkpụrụ mmiri ndị a dagburu dị ukwuu karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha ha gbuo.
JOS 10:12 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ndị Izrel lụgbuo ndị Amọrait. Joshua gwara Onyenwe anyị okwu nʼihu ndị Izrel niile sị, “Gị, anyanwụ, guzo nʼotu ebe na mbara eluigwe Gibiọn. Gị, ọnwa, guzokwa nʼotu ebe na mbara eluigwe na Ndagwurugwu Aijalon”
JOS 10:13 Anyanwụ guzoro, ọnwa guzokwa. Ha abụọ adaghị tutu ruo mgbe ndị agha mba ahụ gbuchasịrị ndị iro ha. Ihe banyere akụkọ agha a ka e dere nʼakwụkwọ Jasha. Ya mere, anyanwụ guzoro nʼotu ebe nʼetiti mbara eluigwe. Ọ nọkwa nʼotu ebe ihe dịka otu ụbọchị zuru ezu.
JOS 10:14 O nweghị ụbọchị ọzọ dịka ụbọchị ahụ nʼoge niile gara aga. Ọ dịbekwaghị ụbọchị yiri ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ bụ ụbọchị Onyenwe anyị mere ka anyanwụ na ọnwa kwụsị, nʼihi naanị ekpere otu nwoke. Nʼihi na Onyenwe anyị na-eburu Izrel agha.
JOS 10:15 Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu dị na Gilgal.
JOS 10:16 Ma nʼoge ahụ a na-alụ agha ahụ, ndị eze ise ahụ si nʼọgbọ agha gbapụ, zoo onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda.
JOS 10:17 Mgbe ozi ruru Joshua ntị, na a chọtala eze ise ndị ahụ, ebe ha zoro onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda,
JOS 10:18 Joshua nyere iwu sị, “Werenụ nkume buru ibu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Debekwanụ ndị nche nʼebe ahụ, ka ha chee ndị eze ahụ nche.
JOS 10:19 Ma unu eguzola nʼebe ahụ nʼonwe unu, chụsonụ ndị iro unu, na-egbukwanụ ha site nʼazụ. Unu ekwela ka ha gbaba nʼobodo ha dị iche iche, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu enyefeela ha nʼaka unu.”
JOS 10:20 Ya mere, Joshua na ndị Izrel tigbuchara ha kpamkpam nʼụzọ dị egwu, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nʼime ha nwere ike gbaba nʼime obodo ha e wusiri ike.
JOS 10:21 Ndị agha niile laghachikwuru Joshua nʼọmụma ụlọ ikwu ha dị na Makeda nʼudo. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nwara anwa kwuo okwu megide ndị Izrel nʼala ahụ.
JOS 10:22 Mgbe ahụ Joshua sịrị, “Megheenụ ọnụ ọgba nkume ahụ, wepụtanụ ndị eze ise ahụ.”
JOS 10:23 Ya mere, ha kpọpụtara ndị eze ise ahụ site nʼọgba nkume ahụ, ha bụ eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish, na eze Eglọn.
JOS 10:24 Mgbe a kpụtara ha nʼihu Joshua, ọ kpọrọ ndị ikom Izrel niile ka ha zụkọta, ọ gwara ndịisi agha bụ ndị so ya jee, “Bịanụ nso, zọkwasịnụ ụkwụ unu nʼolu eze ndị a.” Ya mere, ha bịara zọkwasị ụkwụ ha nʼolu ha.
JOS 10:25 Joshua sịrị ha, “Unu atụla egwu, maọbụ daa mba. Dịnụ ike, nweekwanụ ume, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị ga-eme ndị iro unu niile bụ ndị na-ebuso unu agha.”
JOS 10:26 Emesịa, Joshua ji mma agha ya gbuo eze ise ndị a. Ọ kwụbara ha nʼelu osisi ise, ebe ha nọ ruo nʼoge anyasị.
JOS 10:27 Ma mgbe anwụ bidoro ịda, Joshua nyere iwu ka e site nʼosisi wedata ozu ndị eze ise ahụ, tụba ha nʼime ọgba nkume ahụ, ebe ha zoro onwe ha. Ha ji nkume dị ukwuu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Nkume ukwuu ahụ dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
JOS 10:28 Nʼotu ụbọchị ahụ, Joshua lara obodo Makeda nʼiyi, jiri mma agha gbuo eze ya, na onye ọbụla bi nʼime ya. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nọ nʼime obodo ahụ ọ hapụrụ ndụ. Otu ihe ahụ o mere eze Jeriko ka o mere eze Makeda.
JOS 10:29 Joshua na ndị Izrel niile so ya sitere na Makeda gaa na Libna lụso ya agha.
JOS 10:30 Onyenwe anyị nyekwara obodo a na eze ya nʼaka Izrel. Joshua weere mma agha ya tigbuo mmadụ niile dị nʼime ya. O nweghị onye ọbụla nke ọ hapụrụ ndụ nʼebe ahụ. O mekwara eze obodo a ihe o mere eze Jeriko.
JOS 10:31 Site na Libna, Joshua na ndị Izrel gara ruo Lakish, lụso ha agha.
JOS 10:32 Ma Onyenwe anyị nyefere Lakish nʼaka ụmụ Izrel. Joshua lụgburu ya nʼụbọchị nke abụọ ya. Ha weere mma agha ha tigbuo mmadụ niile bi nʼime ya, dịka ha mere Libna.
JOS 10:33 Ma mgbe a na-alụ agha na Lakish, Horam eze Gaza, duuru ndị agha ya bịa inyere ndị obodo Lakish aka, ka ha si otu a gbochie ndị agha Izrel ịbata nʼime ya. Ma ndị agha Joshua gburu ya, laa ndị agha ya niile nʼiyi, ruo na ọ fọdụghị otu onye.
JOS 10:34 Emesịa, nʼụbọchị ahụ kwa, Joshua na ndị Izrel hapụrụ Lakish gaa Eglọn lụgbuo ya.
JOS 10:35 Ha were obodo ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, jiri mma agha ha tigbuo mmadụ niile dị nʼime obodo ahụ, dịka ha mere na Lakish.
JOS 10:36 Mgbe Joshua na ndị Izrel sitere nʼEglọn pụọ, ha gara Hebrọn buso ya agha.
JOS 10:37 Ha weere obodo ahụ, jiri mma agha gbuo eze ha, na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha gburu ndị mmadụ niile bi nʼime ya dịka ha mere nʼEglọn. Ọ dịkwaghị otu onye a hapụrụ ndụ.
JOS 10:38 Joshua na ndị Izrel niile ya na ha so laghachiri azụ gaa busoo Debịa agha.
JOS 10:39 Ha meriri obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, na eze ya, jiri mma agha gbuchapụ ha niile, mmadụ niile nọ nʼime ya ka ha gburu kpamkpam. Ha ahapụghị onye ọbụla ndụ, ha mere Debịa na eze ya dịka ha mere Libna na eze ya, na Hebrọn kwa.
JOS 10:40 Ya mere, Joshua na ndị agha ya meriri obodo ahụ niile, na ala ahụ niile. O meriri eze niile nke obodo ugwu ahụ, na ndị bi na Negeb, na mgbada ala ugwu dị nʼọdịda anyanwụ, na mgbada ala ugwu ugwu ahụ. O gbuchara mmadụ niile bi nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya iwu.
JOS 10:41 Joshua tigburu ha niile site na Kadesh Banea ruo Gaza, sitekwa na Goshen ruo Gibiọn.
JOS 10:42 Eze ndị a niile, na ala ha niile, ka Joshua meriri nʼotu oge ibu agha, nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-alụrụ Izrel agha.
JOS 10:43 Emesịa, Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu ha dị na Gilgal.
JOS 11:1 Mgbe Jabin eze Hazọ nụrụ nke a, o ziri ozi zigara Jobab eze ndị Madọn, zigakwara ndị eze obodo Shịmrọn na Akshaf,
JOS 11:2 na ndị eze bi nʼobodo ugwu ugwu, na ndị bi nʼime Araba, na ndịda Kineret, na ndagwurugwu ọdịda anyanwụ, na nʼime Nafọt Doa, nke dị nʼọdịda anyanwụ,
JOS 11:3 zigakwara eze ndị Kenan ndị bi nʼọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ, zigakwara eze ndị Amọrait, na eze ndị Het, na eze ndị Periz, na nke ndị Jebus nke dị nʼala ugwu. O zigakwara eze ndị Hiv ndị bi na ndịda Hemon, na mpaghara Mizpa.
JOS 11:4 Ndị eze a niile kwekọrịtara chịkọtaa ndị agha ha niile nʼotu. Ndị agha ha chịkọtara dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ha ji ọtụtụ ịnyịnya na ọtụtụ ụgbọ agha.
JOS 11:5 Eze ndị a niile zukọrọ maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri Merọm, maka ibuso Izrel agha.
JOS 11:6 Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla ha egwu, nʼihi na echi, nʼoge dịka ugbu a, aga m ewere ha niile nʼọnọdụ ndị egburu egbu nyefee ha nʼaka Izrel. Ị ga-ebipụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, kpọọkwa ụgbọ agha ha niile ọkụ.”
JOS 11:7 Ya mere, Joshua na ndị agha ya niile bịaruru akụkụ mmiri Merọm na mberede, lụso ha agha.
JOS 11:8 Onyenwe anyị nyefere ndị agha ha nʼaka ndị Izrel, ndị lụgburu ha, chụọ ha ọsọ ruo nʼoke ala Saịdọn, ruokwa ebe a na-akpọ Mizrefot Maim, na ruo nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼime Ndagwurugwu Mizpa. Ya mere, o nweghị ọ bụladị otu onye iro a hapụrụ ndụ nʼagha ahụ.
JOS 11:9 Joshua na ndị agha ya mere ha ihe Onyenwe anyị kwuru na a ga-eme ha. Ha gbupụrụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, surekwaa ụgbọ agha ha niile nʼọkụ.
JOS 11:10 Mgbe ahụ, Joshua laghachiri azụ busoo Hazọ agha merie ya, were mma agha gbuo eze ya, nʼihi na Hazọ bụrịị isi obodo alaeze ahụ niile.
JOS 11:11 Ha ji mma agha gbuo ndị niile bi nʼobodo ahụ, bibie ha kpamkpam, ọ dịghị onye a hapụrụ nke na-eku ume. O sukwara Hazọ ọkụ.
JOS 11:12 Joshua weere obodo niile nke ndị eze ahụ na ndị eze ha niile, jiri mma agha gbuchapụ ha. Ọ lakwara ha niile nʼiyi, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
JOS 11:13 Ma ndị Izrel esughị obodo ọbụla nʼime ndị ahụ niile e wuru na mkputamkpu ala ọkụ, karịakwa obodo Hazọ, nke Joshua kpọrọ ọkụ.
JOS 11:14 Ihe niile a kwatara nʼagha nʼobodo ndị a, na anụ ụlọ ha niile, ka ndị Izrel weere. Ma ha gburu mmadụ niile. Ha ahapụghị ọ bụladị otu onye ndụ.
JOS 11:15 Nʼihi na nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis onyeozi ya. Mosis nyekwara Joshua otu iwu a. Ugbu a Joshua emeela dịka a gwara ya. O mezuru ihe ndị a niile, bụ nke Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
JOS 11:16 Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile, bụ ala ugwu ugwu ahụ, na ala Negeb, na ala Goshen, na obosara ala ọdịda anyanwụ ahụ niile, na ala Araba, na ala ugwu ahụ niile, na ala ahụ dị na mgbada ugwu Izrel.
JOS 11:17 Nʼihi nke a, ala ndị Izrel nwere gbasara nʼụzọ niile site nʼugwu Halak, nke dị nso na Sia, ruo Baal-Gad nke dị na Ndagwurugwu Lebanọn, na ndịda ugwu Hemon. Joshua jidere ma gbukwaa ndị eze ndị ala ahụ niile.
JOS 11:18 O were Joshua ogologo oge imeri obodo ndị a niile na eze ha nʼagha.
JOS 11:19 Ọ dịkwaghị obodo ọzọ e mere ka ha na ụmụ Izrel dị nʼudo karịa naanị ndị Hiv, ndị bi na Gibiọn. Obodo ndị ọzọ niile ka a lara nʼiyi.
JOS 11:20 Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị, nʼonwe ya, mere ka ndị eze ahụ nyịchie obi ha, ka ha lụso Izrel agha, ka o si otu a laa ha nʼiyi, kpochapụkwa ha niile, na-emereghị ha amara, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
JOS 11:21 Nʼoge ahụ kwa, Joshua gara kpochapụ ndị Anak ahụ bi nʼala ugwu ugwu, ya bụ, na Hebrọn, na Debịa, na Anab, na ala ugwu ugwu Juda, na ala ugwu ugwu Izrel. O gburu ha niile, laa obodo ha nʼiyi.
JOS 11:22 Ọ dịkwaghị otu onye Anak a hapụrụ ndụ nʼoke ala Izrel niile, karịakwa ndị fọdụrụ na Gaza, na Gat, na nʼime Ashdọd.
JOS 11:23 Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu. O nyekwara ndị Izrel ala ahụ dịka ihe nketa ha. O kenyere ha ala ahụ dịka ebo ha si dị. Site nʼoge ahụ gaa nʼihu, ala ahụ dara jụụ. Ibu agha adịghịkwa nʼime ya ọzọ.
JOS 12:1 Ndị a bụ ndị eze ala ndị ahụ ndị Izrel lara nʼiyi, bụ ala ndị ahụ ha nwetara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Obodo niile a lara nʼiyi bụ ndị dị site na ndagwurugwu iyi Anọn ruo nʼugwu Hemon ha na akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba.
JOS 12:2 Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn. Ala ya gbatịrị site nʼAroea, nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, na nʼetiti ndagwurugwu iyi Anọn, ruo iyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Ọkara ala Gilead, nke dị nʼugwu iyi Jabọk bụkwa ala ya.
JOS 12:3 Ọ bụkwa Saịhọn na-achị akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba site nʼosimiri Kineret ruo nʼosimiri Araba (ya bụ, Osimiri Nnu), ruo Bet-Jeshimọt, gbadaakwa akụkụ ndịda ndịda ruo na mgbada ugwu Pisga.
JOS 12:4 Ha merikwara Ọg, eze Bashan, onye bụ otu nʼime ndị eze ikpeazụ ndị agbụrụ Refaim. Isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei.
JOS 12:5 Ọ chịrị nʼugwu Hemon, Saleka, ala Bashan niile ruo nʼoke ha na ndị Geshua na Maaka nwere, nakwa ọkara nke Gilead, bụ oke ala Saịhọn, bụ eze Heshbọn.
JOS 12:6 Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha.
JOS 12:7 Ndị a bụ aha ndị eze niile Joshua na ụmụ Izrel meriri, nʼofe osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site na Baal-Gad nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, ruo nʼugwu Halak nke dị na mgbago nʼụzọ Sia. Joshua nyere ebo Izrel niile ala ha ndị a dịka ihe nketa, nʼusoro dịka ebo ha si dị.
JOS 12:8 Ala ndị ọzọ bụkwa ala ugwu ugwu ahụ, na ala dị na mgbada ugwu ọdịda anyanwụ, na ala Araba, na ala ndị dị na mgbada ugwu, na ọzara, nakwa Negev. Ndị a bụ ala ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Kenan, ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ndị a bụ ndị eze ahụ:
JOS 12:9 Eze Jeriko, otu eze Ai (nke dị nso na Betel), otu
JOS 12:10 eze Jerusalem, otu eze Hebrọn, otu
JOS 12:11 Eze Jamut, otu eze Lakish, otu
JOS 12:12 eze Eglọn, otu eze Gaza, otu
JOS 12:13 eze Debịa, otu eze Geda, otu
JOS 12:14 eze Homa, otu eze Arad, otu
JOS 12:15 eze Libna, otu eze Adulam, otu
JOS 12:16 eze Makeda, otu eze Betel, otu
JOS 12:17 eze Tapụọa, otu eze Hefa, otu
JOS 12:18 eze Afek, otu eze Lasharọn, otu
JOS 12:19 eze Madọn, otu eze Hazọ, otu
JOS 12:20 eze Shịmrọn Meron, otu eze Akshaf, otu
JOS 12:21 eze Teanak, otu eze Megido, otu
JOS 12:22 eze Kedesh, otu eze Jokneam, nʼime Kamel, otu
JOS 12:23 eze Doa, (nʼime obodo Naftod), otu eze Goiim, nʼime Gilgal, otu na
JOS 12:24 eze Tịaza, otu. Ha niile dị ndị eze iri atọ na otu.
JOS 13:1 Nʼoge a, Joshua aghọọla agadi nwoke,Onyenwe anyị kpọrọ ya sị ya, “Ugbu a, ị ghọọla agadi, ụbọchị ọgwụgwụ ndụ gị abịala nso, ma ọtụtụ ala fọdụrụ ndị a ga-emeri.
JOS 13:2 “Ndị a bụ ala nke fọdụrụ unu ga-enweta: “ala ndị Filistia niile na ala ndị Geshua niile,
JOS 13:3 site nʼosimiri Shaịho dị nʼọnụ Ijipt ruo nʼoke ala Ekrọn, nʼakụkụ ugwu ya, nke a gụnyere ndị Kenan, na ndịisi ise ndị Filistia: ndị Gaza, ndị Ashdọd, ndị Ashkelọn, ndị Gat, na ndị Ekrọn; nakwa ala ndị Ava,
JOS 13:4 site na ndịda ala ahụ niile dị nʼugwu; nʼala ndị Kenan, na Meara, nke bụ ala ndị Saịdọn, ruo nʼAfek, na oke ala ndị Amọrait;
JOS 13:5 na ala ndị Gebal niile; na Lebanọn niile ruo nʼọwụwa anyanwụ, site Baal-Gad nʼokpuru ugwu Hemon ruo na mbata Hamat.
JOS 13:6 “Ndị niile bi nʼala ugwu site na Lebanọn ruo Mizrefot Maim, ya bụ, ndị Saịdọn niile, Mụ onwe m ga-achụpụ ha site nʼihu ụmụ Izrel. Ihe dịrị gị bụ ike ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa nye ndị Izrel, dịka mụ onwe m nyere gị iwu.
JOS 13:7 Ya mere, kere ebo itoolu, na ọkara Manase, ala ndị a niile, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.”
JOS 13:8 Ọkara ebo Manase, na ebo Ruben, na Gad, enwetala ihe nketa ha nʼofe ọzọ nke Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha.
JOS 13:9 Ala ha gbatịrị site nʼAroea nke dị na ndagwurugwu Anọn, na site nʼobodo dị nʼetiti ndagwurugwu ahụ, ruo nʼala dị larịị nke gbatịrị site na Medeba ruo Dibọn.
JOS 13:10 Ọ gbatịkwara ruo nʼoke ala ndị Amọn, tinyere obodo niile nke Saịhọn, eze ndị Amọrait na-achị mgbe o bi na Heshbọn.
JOS 13:11 Ọ gụnyekwara Gilead, nʼoke ala ndị Geshua, na ndị Maaka, na ugwu Hemon niile, na Bashan niile, ruokwa Saleka.
JOS 13:12 Ya bụ, obodo niile nke Ọg eze ndị Bashan na-achị, mgbe isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei. (Ọ bụ eze ikpeazụ nʼagbụrụ ndị Refaim.) Mosis busoro Saịhọn na Ọg agha, tigbuo ha, napụkwa ha ala ha.
JOS 13:13 Ma ndị Izrel achụpụghị ndị Geshua na ndị Maaka, ya mere, ha nọgidere na-ebi nʼetiti ụmụ Izrel ruo taa.
JOS 13:14 O nweghị ala o kenyere ebo Livayị. Nʼihi na Onyenwe anyị kwere ha nkwa na ihe nketa ha ga-abụ ihe aja onyinye niile e si nʼọkụ na-ewetara Onyenwe anyị Chineke Izrel.
JOS 13:15 Nke a bụ ala Mosis nyere ebo Ruben dịka agbụrụ ha si dị, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.
JOS 13:16 Ala ha gbatịrị site nʼAroea, na ndagwurugwu iyi Anọn, sitekwa nʼobodo dị nʼetiti ndagwurugwu ahụ na ala dị larịị gabiga gafee Medeba,
JOS 13:17 ruo Heshbọn, na obodo ndị ọzọ dị nʼala larịị ahụ, tinyere obodo Dibọn, na Bamot Baal, na Bet-Baal-Meon,
JOS 13:18 na Jahaz, na Kedemot, na Mefaat,
JOS 13:19 na Kiriatem, na Sibma, na Zeret Shaha, nke dị nʼugwu nta dị na ndagwurugwu ahụ;
JOS 13:20 na Bet-Peoa, na Bet-Jeshimọt, nke dị nʼebe dị na mgbada ugwu Pisga;
JOS 13:21 na obodo niile dị nʼala larịị ahụ, na ala Saịhọn niile, onye bụ eze ndị Amọrị nke chịrị na Heshbọn. Mosis lụgburu ya, lụgbukwaa ndịisi Midia bụ Evi, na nke Rekem, na nke Zua, na nke Hua, na nke Reba, ụmụ ndị eze ha na Saịhọn jikọtara aka buo agha.
JOS 13:22 Tinyere ndị ha gburu nʼọgbọ agha, ụmụ Izrel ji mma agha gbuo Belam nwa Beoa, onye na-agba aja.
JOS 13:23 Ya mere, oke ala ebo Ruben dị nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Obodo ukwu na obodo nta ndị a bụ ihe ha nwetara dịka ihe nketa ha. Ezinaụlọ ọbụla nwetakwara oke nke ha dịka ikwu ha si dị.
JOS 13:24 Mosis nyekwara ebo Gad ala nke ha site nʼala ahụ ha lụgburu, dịka ikwu ha si dị.
JOS 13:25 Ndị a bụ ala ebo Gad nwetara: ala ahụ niile dị na Jeza, na obodo Gilead niile, na ọkara ala ndị Amọn nke ruru Areoa, nʼakụkụ Raba.
JOS 13:26 Na ala sitere Heshbọn ruo Ramat Mizpa, na Betonim, na sitekwa Mahanaim ruo oke ala Debịa.
JOS 13:27 Nʼime ndagwurugwu ala ha bụ Bet-Haram, na Bet-Nimra, na Sukọt, na Zafọn, na ala fọdụrụ nʼalaeze Saịhọn eze Heshbọn, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼoke ala ya ruokwa nsọtụ osimiri Galili.
JOS 13:28 Obodo ndị a na obodo nta ndị ọzọ bụ ihe nketa ụmụ Gad dịka agbụrụ ha si dị.
JOS 13:29 Mosis nyekwara ikwu ọbụla dị nʼọkara ebo Manase ala nke ha, dịka mkpa ha si dị.
JOS 13:30 Ala ha ketara gbatịrị ruo Mahanaim. Ọ bụ ha nwekwa ala Bashan niile, na ala niile Ọg, eze Bashan, na-achị, tinyere iri obodo nta isii dị na Bashan, nke Jaịa wuru. Ha nwetakwara
JOS 13:31 ọkara Gilead, na Ashtarọt, na Edrei bụ isi obodo alaeze Ọg nʼime Bashan. Ala ndị a niile ka e nyere ọkara ebo Manase, ya bụ ikwu niile e nwere site nʼụmụ Makia, ọkpara Manase.
JOS 13:32 Ndị a bụ otu Mosis si keere ụmụ Izrel ala dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu obodo Jeriko.
JOS 13:33 Ma Mosis enyeghị ebo Livayị ala ọbụla, nʼihi na ọ gwara ha na Onyenwe anyị, Chineke Izrel bụ ihe nketa ha nwere, dịka o kwere ha na nkwa.
JOS 14:1 Otu a ka esi kenye ndị Izrel ala Kenan, bụ nke Elieza onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndị ndu ikwu niile dị nʼebo Izrel kere.
JOS 14:2 Ebo ọbụla nʼime ebo itoolu na ọkara ahụ fọdụrụ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.
JOS 14:3 Ma Mosis enyelarị ebo abụọ na ọkara ala nke ha nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. Ma o kenyeghị ndị Livayị ihe nketa ọbụla nʼetiti ha.
JOS 14:4 Nʼihi na ụmụ Josef dị ebo abụọ, ya bụ Manase na Ifrem. Enyeghị ndị Livayị oke nʼala ahụ, karịa obodo ụfọdụ ebe ha ga-ebi na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
JOS 14:5 Ndị Izrel keere ala ahụ nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
JOS 14:6 Nʼoge a, ụmụ Juda zipụrụ ndị ozi ndị jekwuuru Joshua na Gilgal. Kaleb, nwa Jefune, onye Keniz so ha nʼije a. Mgbe ha bịarutere, Kaleb gwara Joshua okwu sị ya, “I chetakwara okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis onye nke Chineke banyere gị na banyere mụ onwe m, mgbe anyị nọ na Kadesh Banea?
JOS 14:7 Agbara m iri afọ anọ nʼoge ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ anyị ịga iledo ala ndị Kenan anya. Mgbe anyị lọghachiri, agwara m ya okwu, kọwaara ya ihe m chere nʼobi m bụ eziokwu.
JOS 14:8 Ma ụmụnna anyị, ndị anyị na ha so gaa, menyere ụmụ Izrel egwu, mee ka obi ha daa mba ịchọ ịbanye nʼala ahụ e kwere anyị na nkwa. Ma ebe m nọgidere jiri obi m niile soro Onyenwe anyị Chineke m,
JOS 14:9 Mosis ṅụrụ iyi sị m, ‘Ebe ọ bụ na i ji obi gị niile soro Onyenwe anyị Chineke m, ala ahụ i jegharịrị ije nʼelu ya ga-abụ ihe nketa nye gị na ụmụ gị ruo mgbe ebighị ebi.’
JOS 14:10 “Ugbu a, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa, o meela ka m dị ndụ. Nke a bụ iri afọ anọ na ise kemgbe Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ndị a, mgbe Izrel na-awagharị nʼọzara. Ma ugbu a, lee, agbaala m iri afọ asatọ na ise taa.
JOS 14:11 M dị ike taa dịka m dị nʼụbọchị ahụ Mosis zipụrụ m. Dịka ike m dị mgbe ahụ, adịkwa m ike ugbu a, ịpụ buo agha ma batakwa
JOS 14:12 Ya mere, nye m ala ugwu ugwu ahụ Onyenwe anyị kwere m nkwa nʼụbọchị ahụ. Gị onwe gị nụrụ nʼoge ahụ na ụmụ Anak bi nʼebe ahụ, na obodo ha bukwara ibu, na e jikwa mgbidi e wusiri ike gbaa ha gburugburu. Ma site nʼinyeaka Onyenwe anyị, aga m achụpụ ha dịka Onyenwe anyị kwuru.”
JOS 14:13 Nʼihi nke a, Joshua gọziri Kaleb nwa Jefune. O nyere ya obodo Hebrọn ka ọ bụrụ ihe nketa ya.
JOS 14:14 Ya mere, obodo Hebrọn ghọrọ ihe nketa Kaleb nwa Jefune onye Keniz bido mgbe ahụ, nʼihi na o ji obi ya niile soro Onyenwe anyị, Chineke Izrel.
JOS 14:15 Tupu oge a, aha a na-akpọ Hebrọn bụ Kiriat Aaba, nke pụtara Obodo Aaba. Aaba bụkwa aha nwoke kachasị ịdị ukwuu nʼetiti ndị Anak niile. Site nʼoge a gaa nʼihu, e nwere udo nʼala ahụ niile.
JOS 15:1 Ala ndị a ka e nyere ndị Juda dịka ikwu dị nʼebo ahụ si dị. Ikwu ọbụla ketara ala nke ha site nʼife nza. Ala Juda gbatịrị nnọọ ruo nʼoke ala Edọm, gbatịakwa ruo nʼọzara Zin, kwụsị nʼọnụ ọnụ ndịda ọzara a.
JOS 15:2 Nʼakụkụ ndịda, oke ala ha malitere nʼọnụ ọnụ ndịda osimiri Nnu.
JOS 15:3 Site nʼebe akụkụ ndịda nrigo Akrabim, gafee ruo nʼọzara Zin, ma rigoo nʼakụkụ nke ndịda Kadesh Banea, gafee Hezrọn rigoruo na Aada, gba gburugburu gaa Kaka;
JOS 15:4 site nʼebe ahụ ruo Azmọn, pụọ gbasoro iyi dị nʼoke ala ndị Ijipt gagide ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala nʼebe ndịda.
JOS 15:5 Oke ala ha nʼọwụwa anyanwụ bụ oke osimiri Nnu, ruo nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Oke ala ha nʼakụkụ ugwu bidoro nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan,
JOS 15:6 gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba, rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben.
JOS 15:7 Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị ruo na Ndagwurugwu Akọ na Debịa, tụgharịa gbatịrịkwa ruo Gilgal, na ncherita ihu ala ala Adumim nke dị nʼakụkụ ndịda ndagwurugwu ahụ. Site nʼebe ahụ ọ gbatịrị ruo na mmiri En-Shemesh, kwụsị na En-Rogel.
JOS 15:8 Oke ala ahụ gbagoro Ndagwurugwu nke Ben Hinom, rukwaa nʼakụkụ ndịda Jebus nʼebe e wuru obodo Jerusalem. Oke ala ahụ sitekwara ebe ahụ gbagoo ruo nʼelu dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke Ndagwurugwu Hinom, na nsọtụ ugwu nke Ndagwurugwu Refaim.
JOS 15:9 Site nʼelu ugwu ebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị ruo na mmiri ime ala Neftoa, pụta site nʼebe ahụ ruo obodo niile dị nso ugwu Efrọn. Site nʼEfrọn, oke ala ahụ gbadara ruo Baala (nke aha ya ọzọ bụ Kiriat Jearim).
JOS 15:10 Oke ala ahụ mere dịka ọ ga-agba Baala gburugburu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site nʼebe ahụ pụta nʼugwu Sia, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼakụkụ ugwu Jearim (ya bụ Kesalon), gbatịa ruo na ndịda Bet-Shemesh, gafee ruo nʼọdịda anyanwụ oke ala Timna.
JOS 15:11 O sikwara ebe ahụ ruo ndịda ugwu Ekrọn, tụgharịa ruo Shikerọn, gafee ya, ruo nʼugwu Baala, sitekwa nʼebe ahụ ruo Jabneel, oke ala ahụ kwụsịrị nʼosimiri.
JOS 15:12 Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Ndị a bụ oke ala gbara ndị Juda gburugburu dịka ikwu ha niile si dị.
JOS 15:13 Dịka iwu Onyenwe anyị nyere si dị, Joshua nyere Kaleb nwa Jefune oke nʼetiti ndị Juda. O kenyere ya Kiriat Aaba, ya bụ, Hebrọn. Aaba bụ nna nna Anak.
JOS 15:14 Kaleb sitere nʼobodo Hebrọn chụpụ ndị ikom atọ, bụ Sheshai, na Ahiman, na Talmai, ụmụ Anak nʼala ha.
JOS 15:15 O si nʼebe ahụ bilie ịlụso ndị bi na Debịa ọgụ. Nke a na-akpọ Kiriat Sefa nʼoge mbụ.
JOS 15:16 Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa, bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.”
JOS 15:17 Ya mere, Otniel, nwa Kenaz, nwa nwanne Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.
JOS 15:18 Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”
JOS 15:19 Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.
JOS 15:20 Nke a bụ ihe nketa ebo Juda dịka ikwu ha niile si dị.
JOS 15:21 Obodo niile nke ndị ebo Juda dị na Negev, nʼakụkụ ndịda nʼoke ala Edọm bụ ndị a: Kabzeel, Eda, Jaguo,
JOS 15:22 Kina, Dimona, Adada,
JOS 15:23 Kedesh, Hazọ, Itnan,
JOS 15:24 Zif, Telem, Bealot,
JOS 15:25 Hazọ Hadata, Keriọt Hezrọn (ya bụ Hazoa),
JOS 15:26 Amam, Shema, na Molada,
JOS 15:27 Haza Gada, Heshmọn, Bet-Pelet,
JOS 15:28 Haza Shual, Bịasheba, Biziotịa,
JOS 15:29 Baala, Iyim, Ezem,
JOS 15:30 Eltolad, Kesil, Homa,
JOS 15:31 Ziklag, Madmanna, Sansanna,
JOS 15:32 Lebaot, Shilhim, Ain na Rimọn. Ọnụọgụgụ obodo ndị a dị iri abụọ na itoolu. Obodo nta ndị ọzọ gbara ha niile gburugburu.
JOS 15:33 Obodo niile ndị a dị na ndịda ugwu ka e nyekwara ebo Juda. Obodo ndị a bụ, Eshtaol, Zora, Ashna,
JOS 15:34 Zanoa, En-Ganim, Tapụọa, Enam,
JOS 15:35 Jamut, Adulam, Soko, Azeka,
JOS 15:36 Shaaraim, Aditaịm na Gedera (maọbụ Gederotaịm). Ha niile dị obodo iri na anọ. Obodo nta ndị ọzọ gbakwara ha gburugburu.
JOS 15:37 Ebo Juda ketara Zenan, Hadasha, Migdal Gad,
JOS 15:38 Dilean, Mizpa, Jekteel,
JOS 15:39 Lakish, Bozkat, Eglọn,
JOS 15:40 Kabọn, Laamam, Kitlish,
JOS 15:41 Gederọt, Bet-Dagọn, Naama na Makeda. Obodo ndị a dị iri na isii, tinyekwara obodo nta ha. Ndị Juda ketakwara:
JOS 15:42 Libna, Eta, Ashan
JOS 15:43 Ifta, Ashna, Nezib,
JOS 15:44 Keila, Akzib na Maresha. Ha niile dị obodo itoolu, tinyekwara obodo nta ha niile.
JOS 15:45 Ha ketakwara Ekrọn, na obodo nta ya niile.
JOS 15:46 Ọ bụ ha nwekwa obodo niile dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Ekrọn, ndị dị nso nso Ashdọd, na obodo nta niile dị ha nso.
JOS 15:47 Ma Ashdọd nʼonwe ya, na ụmụ obodo nta ya niile, na Gaza na obodo nta ya niile, ruo nʼiyi Ijipt, na ruo nʼoke osimiri Mediterenịa.
JOS 15:48 Ha nwetakwara ala ndị dị nʼugwu ugwu bụ, Shamia, Jatịa, Sokoh,
JOS 15:49 Dana, Kiriat-Sana (ya bụ Debịa),
JOS 15:50 Anab, Eshtemo, Anim,
JOS 15:51 Goshen, Họlọn na Gailo, ha niile dị obodo iri na otu tinyere obodo nta ha niile.
JOS 15:52 Obodo ndị ọzọ bụ Arab, Duma, Eshan,
JOS 15:53 Janim, Bet-Tapụọa, Afeka,
JOS 15:54 Humta, Kiriat Aba nke bụ Hebrọn na Zior, obodo itoolu tinyere obodo nta ha niile.
JOS 15:55 Maon, Kamel, Zif, Juta,
JOS 15:56 Jezril, na Jokdeam, Zanoa,
JOS 15:57 Kain, Gibea na Timna, obodo iri tinyere obodo nta ha niile.
JOS 15:58 Halhaul, Bet Zoa, Gedoa,
JOS 15:59 Maarat, Bet-Anot na Eltekọn, obodo isii tinyere obodo nta ha niile.
JOS 15:60 Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim na Raba, obodo abụọ tinyere obodo nta ha niile.
JOS 15:61 Obodo ha ndị dị nʼọzara bụ ndị a: Bet-Araba, Midin, Sekaka,
JOS 15:62 Nibshan, Obodo Nnu na En-Gedi, obodo isii tinyere obodo nta ha niile.
JOS 15:63 Ma ebo Juda enweghị ike ịchụpụ ndị Jebus bi nʼime Jerusalem; ruo taa ndị Jebus bi na Jerusalem, nʼetiti ụmụ Juda.
JOS 16:1 Ala e kenyere ụmụ ụmụ Josef bidoro nʼosimiri Jọdan nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jeriko gbatịrị ruo nʼọzara. O sitere na Jeriko gbagoo ala ugwu ugwu ahụ, ruokwa Betel.
JOS 16:2 O sitekwara Betel (ya bụ Luz), gafee ruo Atarọt, ebe ndị Akai bi.
JOS 16:3 Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ rute ala ndị Jaflet, ruo ala mgbada mgbada Bet-Horon. O si nʼebe ahụ ruo Gaza, tutu kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.
JOS 16:4 Ụmụ Josef bụ Ifrem, na Manase nwetara ihe nketa ha.
JOS 16:5 Ndị a bụ ala nke ikwu dị iche iche dị nʼebo Ifrem nwetara. Oke ala ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ malitere nʼAtarọt-Ada. Site nʼebe ahụ, o ruru nʼakụkụ elu elu Bet-Horon;
JOS 16:6 sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼosimiri Mediterenịa. Oke ala ha nʼakụkụ ugwu malitere na Mikmetat, gafee nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Taanat Shaịlo, gafee ya ruo na Janoa.
JOS 16:7 O sitere na Janoa gbadaa ruo Atarọt, na Naara, bịaruo Jeriko, gafee, kwụsị nʼosimiri Jọdan.
JOS 16:8 Oke ala ahụ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ sitere na Tapụọa gaa ruo iyi Kana, na ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ ala ebo Ifrem ketara, dịka ikwu ha si dị.
JOS 16:9 E tinyere obodo ukwu na obodo nta niile ekepụtara iche nʼihi ebo Ifrem nʼetiti ihe nketa ụmụ Manase.
JOS 16:10 Ma ha achụpụghị ndị Kenan ndị bi na Gaza. Nʼihi nke a, ndị Kenan binyere ndị Ifrem ruo taa, ma e mere ka ha bụrụ ndị ọrụ ngo.
JOS 17:1 Nke a bụ oke e kenyere ndị ebo Manase, bụ ọkpara Josef, ya bụ Makia ọkpara Manase, onye bụ nna nna ndị Gilead. Onye natara ala Gilead na Bashan, nʼihi na ndị agbụrụ Makia bụ dike nʼagha.
JOS 17:2 Ya mere, oke a dịịrị ndị fọdụrụ nʼebo Manase dịka ezinaụlọ ha si dị. Agbụrụ Abieza, Helek, Asriel, Shekem, Hefa na Shemida. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom agbụrụ Manase, nwa Josef, dịka ikwu ha si dị.
JOS 17:3 Ma Zelofehad, nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, amụtaghị ụmụ ndị ikom kama ọ mụtara naanị ụmụ ndị inyom, ndị aha ha bụ nke a: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza.
JOS 17:4 Ndị inyom ndị a bịakwutere Elieza, onye nchụaja na Joshua nwa Nun, nʼihu ndị ndu ụmụ Izrel niile sị ha, “Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya kenye anyị ala nke anyị, dịka o si kenye ụmụ ndị ikom ikwu anyị.” Ya mere, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu, Joshua nyere ha ihe nketa ruuru ha nʼetiti ụmụnne nna ha, dịka ndị ọzọ si keta.
JOS 17:5 Manase chịtara ala oke iri, tinyere Gilead, na Bashan nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan,
JOS 17:6 nʼihi na e mere ka ndị inyom Manase keta oke nʼetiti ndị ikom ebo Manase. Ala fọdụrụ na Gilead bụ ndị ikom ebo Manase nwe ya.
JOS 17:7 Oke ala ebo Manase gbatịrị site nʼAsha ruo na Mikmetat, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Shekem. Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ndịda site nʼebe ahụ tinyere ndị bi nʼala En-Tapụọa.
JOS 17:8 Ala dị gburugburu Tapụọa bụ ala ebo Manase, ma obodo Tapụọa nʼonwe ya, nke dị nʼoke ala ebo Manase, bụ obodo ebo Ifrem.
JOS 17:9 Oke ala ụmụ Manase gbatịrị ga ndịda ruo na mmiri iyi Kana. Ụfọdụ obodo ndị Ifrem dị nʼebe ahụ, nʼetiti obodo ndị Manase, kama oke ala ndị Manase nʼakụkụ ugwu iyi ahụ kwụsịrị nʼosimiri Mediterenịa.
JOS 17:10 Ala dị na ndịda bụ nke e kenyere Ifrem, ma ala mgbago ugwu bụ nke Manase. Ala ndị Manase gbatịrị ruo nʼosimiri Mediterenịa ma ha na ndị Asha nwekọrọ oke ala nʼakụkụ ugwu, ebe ha na ndị Isaka nwere oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
JOS 17:11 Manase ka e nyere obodo ndị a, nke dị nʼala e nyere Isaka na Asha: obodo Bet-Shan, na Ibleam, na Doa, na Endoa, na Teanak, na Megido, na obodo nta niile gbara ha gburugburu. Obodo nke atọ bụ Nafọt.
JOS 17:12 Ma ụmụ Manase enweghị ike ịchụpụ ndị Kenan bi nʼobodo ndị ahụ, nʼihi na ndị Kenan nọgidere bichie obodo ndị a.
JOS 17:13 Ma nʼikpeazụ, mgbe ụmụ Izrel ghọrọ ndị dị ike, ha achụpụghị ndị Kenan niile bi nʼobodo ndị a kpamkpam, kama ha mere ka ha bụrụ ndị na-ejere ụmụ Izrel ozi, dịka ndị ohu ha.
JOS 17:14 Ma ụmụ ụmụ Josef sịrị Joshua, “Gịnị mere i ji nye anyị naanị otu ụzọ ala ka ọ bụrụ ihe nketa anyị? Ị hụrụ na Onyenwe anyị gọziri anyị mee ka ọnụọgụgụ anyị baa ụba.”
JOS 17:15 Joshua zara sị ha: “Ọ bụrụ na ala ugwu ugwu Ifrem agaghị ezuru unu nʼihi na unu bara ụba nʼọnụọgụgụ, gaanụ nʼoke ọhịa sụchasịa ala, nʼime ala ndị Periz, na nke ndị Refaim.”
JOS 17:16 Ụmụ Josef zara Joshua sị, “Ala ugwu ugwu a agaghị ezuru anyị. Ọzọ, ndị Kenan niile bi nʼala dị larịị nwere ụgbọala igwe, ma ndị niile bi na Bet-Shan, na ụmụ obodo nta ha na ndị bikwa na Ndagwurugwu Jezril.”
JOS 17:17 Ma Joshua zara ụmụ Josef, ya bụ, Ifrem na Manase, sị ha, “Unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, bụrụkwa ndị dị ike, ọ bụghị naanị otu oke ka unu ga-eketa,
JOS 17:18 nʼihi na ala ugwu ugwu oke ọhịa ahụ bụkwa nke unu. Sụchaanụ ya, ruo na nsọtụ ya, ka ọ bụrụ nke unu. Ọ bụ ezie na ndị Kenan bi nʼime ya nwere ụgbọ agha igwe, bụrụkwa ndị sịrị ike, unu nwere ike ịchụpụ ha.”
JOS 18:1 Ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo maa ụlọ nzute nʼebe ahụ. Nʼoge a, ala ahụ niile bịara nʼokpuru ọchịchị ndị Izrel,
JOS 18:2 ma e nwekwara ebo Izrel asaa a na-ekenyebeghị ala nke ha dịka ihe nketa.
JOS 18:3 Ya mere, Joshua jụrụ ụmụ Izrel ajụjụ sị ha, “Ruo ole mgbe ka unu ga-eche tupu unu ekpochapụ ndị niile bi nʼala a, inweta ala Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nyere unu?
JOS 18:4 Họpụtanụ ndị ikom atọ site nʼebo ọbụla, ndị m ga-eziga ka ha gaa jegharịa nʼala niile ahụ, dee ya nʼakwụkwọ nkọwa otu ihe nketa ọbụla si dị, nʼakụkụ ya niile. Mgbe ahụ, ha ga-alọghachikwute m.
JOS 18:5 Ha ga-eke ala ahụ fọdụrụ ụzọ asaa. Ma ebo Juda ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ndịda, ụmụ ụmụ Josef kwa ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ugwu.
JOS 18:6 Unu depụtachaa ụzọ asaa ndị a nʼakwụkwọ, werenụ ya bịakwute m ka m feere unu nza nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị ịchọpụta ebo ga-eketa akụkụ ọbụla nʼala ahụ.
JOS 18:7 Ma ndị Livayị agaghị eketa ala ọbụla nʼetiti unu, nʼihi na ihe nketa ha bụ ọrụ nchụaja ha na-arụ nʼihu Onyenwe anyị. Ebo Gad, na Ruben, na ọkara ebo Manase agaghị enwetakwa oke ọzọ, nʼihi na ha anarala ihe nketa nke ha nʼofe Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe Mosis onyeozi Onyenwe anyị kwere ha na nkwa na ha ga-ebi.”
JOS 18:8 Ya mere, mgbe ndị ikom nledo ahụ gawara ijegharị nʼala ahụ niile, Joshua gwara ha okwu sị, “Jeenụ jegharịa nʼala ahụ niile. Depụtakwanụ otu unu chere a ga-esi kee ya nʼakwụkwọ. Mgbe unu lọtara aga m anọ nʼebe a bụ Shaịlo jụta Onyenwe anyị ase site nʼife nza, chọpụta ala nke ebo ọbụla ga-eketa.”
JOS 18:9 Ndị ikom ahụ gabigara ala ahụ, depụta ya nʼakwụkwọ, nʼobodo nʼobodo dịka o si dị nʼoke asaa. Mgbe ha mesịrị nke a, ha lọghachikwutere Joshua nʼọmụma ụlọ ikwu nʼime Shaịlo.
JOS 18:10 Joshua feere ha nza na Shaịlo nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ ka ọ nọ keere ndị Izrel ala ahụ dịka ebo ha si dị.
JOS 18:11 Ndị mbụ e kenyere ala site nʼife nza bụ ebo Benjamin dịka ikwu ha si dị. Ala niile e kenyere ebo Benjamin bụ nke dị nʼetiti ala e nyere ebo Juda na Josef.
JOS 18:12 Oke ala ha nʼakụkụ ugwu sitere nʼosimiri Jọdan ruo nʼakụkụ ugwu Jeriko. Nʼọdịda anyanwụ o sitere na Jeriko ruo ala ugwu ugwu ahụ niile, ruokwa nʼọzara Bet-Aven.
JOS 18:13 Oke ala ahụ sitekwara nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ Luz (ebe a na-akpọkwa Betel), ruokwa Atarọt-Ada, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu dị na mgbada Bet-Horon.
JOS 18:14 Site nʼugwu ahụ chere Bet-Horon ihu nʼakụkụ ndịda, oke ala ahụ gbadara ndịda gbasoro akụkụ ọdịda anyanwụ pụta na Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim, otu nʼime obodo ndị Juda. Nke a bụ oke ala ahụ nʼọdịda anyanwụ.
JOS 18:15 Oke ala ha na ndịda sitere na nsọtụ akụkụ Kiriat Jearim rute nʼisi iyi mmiri Neftoa.
JOS 18:16 O sitekwara nʼebe ahụ gbada ruo na ndịda ugwu ahụ nke chere ihu na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nʼakụkụ ugwu Ndagwurugwu nke Refaim. O sitekwara nʼebe ahụ gafee ruokwa nʼakụkụ ndịda ugwu obodo ndị Jebus, ruo En-Rogel.
JOS 18:17 Site nʼEn Rogel oke ala ahụ gbatịrị ruo En-Shemesh, gafee ruo Gelilọt, nke chere ihu na nrigo ugwu Adumim. O si nʼebe ahụ ruo na nkume Bohan, nwa Ruben.
JOS 18:18 O sitere nʼebe ahụ gafee nʼakụkụ ugwu Bet-Araba gbadata rute nʼAraba,
JOS 18:19 ọ gafere gbatịrị ruo nʼakụkụ Bet-Hogla na mgbago ugwu, pụta nʼakụkụ ugwu nke osimiri Nnu, nke bụ nʼakụkụ ndịda ọnụ mmiri osimiri Jọdan. Nke a bụ oke ala ha nʼakụkụ ndịda.
JOS 18:20 Oke ala ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ bụ osimiri Jọdan. Ndị a bụ ihe nketa ụmụ Benjamin, dịka oke ala ya niile si dị gburugburu, dị ka ikwu ya niile si dị nʼakụkụ niile.
JOS 18:21 Ndị a bụ obodo e kenyere ebo Benjamin, dịka ikwu ha si dị: Jeriko, Bet-Hogla, Emek Keziz,
JOS 18:22 Bet-Araba, Zemaraim, Betel,
JOS 18:23 Avim, Para, Ofra,
JOS 18:24 Kefa Amoni, Ofni, Geba, obodo iri na abụọ na obodo nta ha ndị ọzọ.
JOS 18:25 Na Gibiọn, Rema, Beerọt,
JOS 18:26 Mizpa, Kefira, Moza,
JOS 18:27 Rekem, Iapeel, Tarala,
JOS 18:28 Zela, Haelef na obodo ndị Jebus, nke aha ya bụ Jerusalem, Gibea na Kiriat Jearim, obodo iri na anọ na obodo nta niile gbara ha gburugburu. Ndị a bụ ihe nketa ụmụ Benjamin maka ikwu ya niile.
JOS 19:1 Ndị nke abụọ sitere nʼife nza nweta oke ha bụ ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha ketara dị nʼime ala e kenyere ndị Juda.
JOS 19:2 Ihe nketa ụmụ Simiọn bụ ndị a: Bịasheba (maọbụ Sheba), Molada,
JOS 19:3 Haza Shual, Bala, Ezem,
JOS 19:4 Eltolad, Betul, Homa,
JOS 19:5 Ziklag, Bet-Makabot, Haza Susa,
JOS 19:6 Bet-Lebaot na Sharuhen, obodo iri na atọ na obodo nta ndị ọzọ gbara ha gburugburu.
JOS 19:7 Na Ain, Rimọn, Eta na Ashan, obodo anọ na obodo nta ha,
JOS 19:8 tinyekwara obodo nta ndị ọzọ niile gbara obodo ukwu ndị a gburugburu, ruo obodo Baalat-Bịa, ya bụ (obodo Rema dị na Negev). Nke a bụ ihe nketa ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị.
JOS 19:9 E sitere nʼoke ụmụ Juda wepụta oke ụmụ Simiọn, nʼihi na ihe ụmụ Juda ketara dị ukwuu karịa ihe ha kwesiri iketa. Ọ bụ nke a mere ụmụ Simiọn ji nweta ihe nketa site nʼetiti ala ndị Juda.
JOS 19:10 Ebo nke atọ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza bụ ebo Zebụlọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha nwetara gbatịrị ruo Sarid.
JOS 19:11 Site nʼebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị gaa nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ruo Marala na Dabeshet, rukwaa iyi dị nʼihu Jokneam.
JOS 19:12 O si na Sarid chigharịa ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ahụ ruru nʼoke ala Kislọt Teboa, gbagorokwa ruo Daberat, ruokwa Jafia.
JOS 19:13 Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Gat Hefa, Et Kazin na Rimọn, tụgharịa nʼụzọ e si aga Nea.
JOS 19:14 Nʼebe ahụ, ọ gara gburugburu nʼakụkụ ugwu ruo Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ifta El ebe ọ sọtụrụ.
JOS 19:15 Obodo ndị a niile dịkwa nʼime ihe nketa ụmụ Zebụlọn: Katat, Nahalal, Shịmrọn, Idala na Betlehem. Obodo niile ndị a dị iri na abụọ, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
JOS 19:16 Obodo ndị a niile na obodo nta ha, so nʼala ụmụ Zebụlọn nwetara dịka ihe nketa ha, dịka ikwu ha si dị.
JOS 19:17 Ebo nke anọ sitere nʼife nza nweta ihe nketa ha bụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị.
JOS 19:18 Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Jezril, Kesulọt, Shunem,
JOS 19:19 Hafaraim, na Shịọn, Anaharat,
JOS 19:20 Rabit, Kishiọn, Ebez na
JOS 19:21 Remet, En-Ganim, En-Hada na Bet-Pazez.
JOS 19:22 Oke ala ha ruru na Taboa, Shahazuma na Bet-Shemesh, ma kwụsị nʼosimiri Jọdan. Obodo ndị a niile dị iri na isii, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
JOS 19:23 Ya mere, obodo ukwu ndị a na obodo nta ha dị nʼala ahụ ebo Isaka nwetara dịka ihe nketa ha, dị ka ikwu ha si dị.
JOS 19:24 Ebo nke ise e kenyere ala site nʼife nza bụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị.
JOS 19:25 Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Helkat, Hali, Beten, Akshaf,
JOS 19:26 Alamelek, Amad na Mishal. Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ gbatịrị ruo Kamel na Shihoa-Libnat.
JOS 19:27 O sitere nʼebe ahụ tụgharịa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ gawa Bet-Dagọn, ma ruokwa Zebụlọn na Ndagwurugwu Ifta El, ma gbagoro ruokwa Bet-Emek na Neiel. O sikwa nʼebe ahụ gafee, ruo Kabul, nʼakụkụ aka ekpe.
JOS 19:28 Ọ gara ruo Ebrọn, Rehob, Hamọn na Kana, ruokwa ebe obodo Saịdọn gbasapụrụ.
JOS 19:29 Oke ala ahụ mere dịka ọ na-alaghachi azụ bịaruo Rema, ruokwa obodo e wusiri ike bụ Taịa, tụgharịakwa gawa Hosa pụta nʼọnụ mmiri osimiri Mediterenịa nke dị nʼakụkụ Akzib
JOS 19:30 na Umma, Afek na Rehob. Ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri abụọ na abụọ tinyere obodo nta ha niile.
JOS 19:31 Obodo ndị a na obodo nta ha niile dị nʼala ahụ ebo Asha nwetara dịka ihe nketa, dịka ikwu ha si dị.
JOS 19:32 Ebo nke isii e nyere ihe nketa site nʼife nza bụ ebo Naftalị, dịka ikwu ha si dị.
JOS 19:33 Oke ala ha malitere na Helef ruo nʼosisi ukwu dị na Zaananim, Adami Nekeb na Jabneel, gafee ruo Lakum, kwụsị nʼosimiri Jọdan.
JOS 19:34 Site nʼebe ahụ oke ala ha gara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo Aznot Tabo, site nʼebe ahụ ruo Hukọk, rute Zebụlọn na ndịda, na Asha nʼọdịda anyanwụ, ruokwa Juda nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.
JOS 19:35 Obodo niile e wusiri ike e kenyere ha bụ ndị a: Zidim, Zea, Hamat, Rakat, Kineret,
JOS 19:36 Adama, Rema, Hazọ,
JOS 19:37 Kedesh, Edrei, En-Hazoa,
JOS 19:38 Iron, Migdal El, Horem, Bet-Anat na Bet-Shemesh. Ya mere, ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri na itoolu, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
JOS 19:39 Obodo ndị a na obodo nta ha niile ka ebo Naftalị dịka ikwu ha si dị, nwetara dịka ihe nketa ha.
JOS 19:40 Site nʼife nza ebo Dan, bụ ebo nke asaa nwetara ihe nketa dịka ikwu ha si dị.
JOS 19:41 Oke ala ihe nketa ha bụ ndị a: Zora, Eshtaol, Ia-Shemesh,
JOS 19:42 Shaalabin, Aijalon, Itla,
JOS 19:43 Elọn, Timna, Ekrọn,
JOS 19:44 Elteke, Gibeton, Baalat,
JOS 19:45 Jehud, Bene-Berak, Gat Rimọn,
JOS 19:46 Me-Jakọn na Rakọn, obodo dị nʼoke ala, na ncherita ihu Jopa.
JOS 19:47 Mgbe oke ala ụmụ Dan ketara sitere nʼaka ha pụọ. Ha gara buso obodo Leshem agha merie ha, were mma agha tigbuo ndị niile bi nʼime ya, bichie ya. Ha kpọrọ obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna nna ha ochie.
JOS 19:48 Obodo ndị a na obodo nta ha bụ ihe nketa ebo Dan nwetara dịka ikwu ha si dị.
JOS 19:49 Mgbe e kechara ala ahụ niile, nye ebo ọbụla ala dịka ọnụọgụgụ ha niile si dị, ụmụ Izrel nyere Joshua, nwa Nun ihe nketa ha nʼetiti ha.
JOS 19:50 Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na Joshua nwere ike iwere ala ọbụla ọ chọrọ. Ya mere, ha nyere Joshua obodo Timnat Sera nke dị nʼugwu Ifrem. Joshua wugharịrị obodo ahụ biri nʼime ya.
JOS 19:51 Ndị a bụ oke ala nke Elieza onye nchụaja, Joshua nwa Nun na ndịisi ụlọ ebo ụmụ Izrel, kere na Shaịlo site nʼife nza nʼihu Onyenwe anyị, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ha si otu a kebie ala ahụ.
JOS 20:1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya,
JOS 20:2 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha họpụtara onwe unu obodo mgbaba dịka m gwara unu site nʼaka Mosis.
JOS 20:3 Ka obodo ndị a bụrụ ebe onye gburu mmadụ nʼọghọm na-amaghị ama ga-agbaga nʼihi izere ndụ ya site nʼaka onye ahụ ga-achọ ịbọrọ ọbọ ọchụ.
JOS 20:4 Mgbe onye gburu mmadụ ahụ na-amaghị ama gbabara nʼime otu obodo ndị a, ọ ga-eguzo nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ gwa ndị okenye obodo ahụ ihe niile mere. Ndị okenye ahụ ga-akpọbata ya nʼime obodo ahụ, nye ya ebe ọ ga-ebi nʼetiti ha.
JOS 20:5 Ọ bụrụkwa na onye ikwu onye ahụ nwụrụ anwụ abịa ịbọrọ ọbọ ọchụ ahụ, ndị okenye obodo ahụ agaghị ekwe ka e gbuo onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama, nʼihi na onye ahụ akpachaghị anya mee ihe o mere.
JOS 20:6 Onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama ga-anọgide nʼobodo ahụ ruo mgbe ọ ga-akwụrụ nʼihu nzukọ maka ikpe ruokwa mgbe onyeisi nchụaja nọ nʼoge ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, o nwere ike laghachi nʼụlọ nke aka ya na nʼobodo ya bụ ebe o si gbapụ ọsọ.”
JOS 20:7 Obodo ndị ha kewapụtara iche dịka obodo mgbaba bụ, Kedesh, nke dị nʼime Galili, nʼala ugwu ugwu ndị Naftalị; na Shekem, nke dị nʼala ugwu ugwu Ifrem na Kiriat Aba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Ọ dị nʼala ugwu ugwu Juda.
JOS 20:8 Ha kewapụtara obodo atọ ọzọ nʼihi otu ihe ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼofe Jeriko. Obodo atọ ndị a bụ, Beza, nke dị nʼọzara, nʼala larịị ahụ e nyere ebo Ruben, na Ramọt; nke dị nʼime Gilead bụ ala ebo Gad; na Golan, nʼime Bashan, nke e si nʼala ebo Manase wepụta.
JOS 20:9 Obodo mgbaba ndị a a họpụtara bụ maka ndị ọbịa bi nʼetiti ụmụ Izrel, na maka ụmụ Izrel. Ọ bụ ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama ga-agbaga. Onye na-abọrọ ọbọ ọchụ agaghị egbukwa onye ahụ tupu e kpee ya ikpe nʼọgbakọ ndị Izrel.
JOS 21:1 Emesịa, ndị ndu ezinaụlọ Livayị bịakwutere Elieza, onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndịisi ebo Izrel,
JOS 21:2 na Shaịlo, nʼime ala Kenan, sị ha, “Onyenwe anyị nyere iwu site nʼaka Mosis ka enye anyị obodo ụfọdụ ebe anyị ga-ebi, na ala ebe anụ ụlọ anyị ga na-ata ahịhịa.”
JOS 21:3 Nʼihi nke a, dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ụmụ Izrel sitere nʼihe nketa ha nye ndị Livayị obodo ụfọdụ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.
JOS 21:4 Ndị buru ụzọ nweta oke site nʼife nza bụ ikwu Kohat dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼala ndị Juda, na Simiọn, na Benjamin nye ha obodo iri na atọ, ka ọ bụrụ ihe nketa ụmụ Kohat ndị si nʼebo Livayị, ndị bụkwa ụmụ ụmụ Erọn onye nchụaja.
JOS 21:5 Ma ndị fọdụrụ nʼụmụ Kohat ka e nyere obodo iri site nʼobodo nke ikwu ndị ebo Ifrem, na Dan, na ọkara ebo Manase.
JOS 21:6 Ụmụ Geshọn nwetara obodo iri na atọ site nʼife nza. Obodo ha nwetara dị na Bashan. Ha sikwa nʼala ndị ikwu ebo Isaka na Asha, na Naftalị, na ọkara ebo Manase nweta oke ahụ.
JOS 21:7 Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị ketara obodo iri na abụọ site nʼala ndị ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.
JOS 21:8 Ya mere, ụmụ Izrel mezuru iwu niile Onyenwe anyị nyere Mosis site nʼikenye ndị Livayị obodo ha ga-ebi, nakwa ebe anụ ụlọ ha ga-ata nri.
JOS 21:9 Ha sitere nʼebo Juda na Simiọn, kepụta obodo ndị a akpọrọ aha
JOS 21:10 kenye ndị ikwu Kohat, ndị bụ ụmụ ụmụ Erọn, bụrụkwa ụmụ ụmụ Livayị. Ọ bụ ha ka e bụ ụzọ kenye ihe nketa site nʼife nza.
JOS 21:11 E kenyere ha obodo Kiriat Aaba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Obodo a dị nʼala ugwu ugwu Juda, ya na ala gbara ya gburugburu ka ọ bụrụ ebe ịta nri anụ ụlọ. (Aaba bụ nna nna ndị Anak.)
JOS 21:12 Ma eburularị ụzọ nye Kaleb nwa Jefune obodo ukwu na obodo nta niile, na ala ubi niile dị nʼakụkụ ya ka ọ bụrụ ihe nketa ya.
JOS 21:13 Ya mere, ụmụ ụmụ Erọn, onye nchụaja, ka e kenyere obodo Hebrọn, nke bụkwa obodo mgbaba, kenyekwa ha obodo ndị a: Libna,
JOS 21:14 Jatịa, Eshtemoa,
JOS 21:15 Họlọn, Debịa,
JOS 21:16 Ain, Juta na Bet-Shemesh. E nyekwara ha ala niile gbara obodo ndị a gburugburu ka ọ bụrụ ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Ya mere, ọ bụ obodo itoolu ka e si nʼala ebo Juda na Simiọn kenye ha.
JOS 21:17 Ebo Benjamin nyere ha obodo anọ ndị a, Gibiọn, Geba,
JOS 21:18 Anatot, Almon na ala dị ya gburugburu ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri, bụ obodo anọ.
JOS 21:19 Ya mere, obodo niile e nyere ndị nchụaja, ụmụ ụmụ Erọn dị iri na atọ, tinyere ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.
JOS 21:20 Ụmụ Kohat ndị fọdụrụ, ndị agbụrụ Livayị ka e kenyere obodo anọ ndị a site nʼaka ebo Ifrem.
JOS 21:21 E sitere nʼala ugwu ugwu Ifrem nye ha: Shekem, nke bụ obodo mgbaba na Gaza,
JOS 21:22 Kibzaim na Bet-Horon, tinyere ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
JOS 21:23 Ha sitere nʼala ndị ebo Dan keta obodo anọ ndị a: Elteke na Gibeton,
JOS 21:24 Aijalon na Gat Rimọn, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
JOS 21:25 Ọkara ebo Manase nyere ha obodo abụọ, Teanak, Gat Rimọn na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ha.
JOS 21:26 Ya mere, obodo niile na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ e nyere ndị fọdụrụ nʼikwu Kohat dị iri.
JOS 21:27 Ụmụ Geshọn, ndị agbụrụ Livayị, ketara obodo abụọ ndị a, ya na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. Ọkara ebo Manase nyere: Golan, nʼime Bashan, nke bụ obodo mgbaba, na Be Eshtera.
JOS 21:28 Ebo Isaka nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ, Kishiọn, Daberat,
JOS 21:29 Jamut na En-Ganim, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ.
JOS 21:30 Ebo Asha nyekwara ha obodo anọ. Ha bụ, Mishal, Abdon,
JOS 21:31 Helkat na Rehob, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ.
JOS 21:32 Ebo Naftalị nyere ha obodo atọ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Obodo ndị a bụ, Kedesh, nʼime Galili, nke bụkwa obodo mgbaba, Hamot Doa na Katan.
JOS 21:33 Obodo iri na atọ, na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ka e nyere ikwu Geshọn.
JOS 21:34 Ndị ikwu Merari, bụ ụmụ ụmụ Livayị fọdụrụ nwetara site nʼaka: Ebo Zebụlọn, Jokneam, Kata,
JOS 21:35 Dimna na Nahalal, obodo anọ tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
JOS 21:36 Ebo Ruben nyere ha obodo anọ: Beza, Jahaz,
JOS 21:37 Kedemot, Mefaat na ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ kpaa nri.
JOS 21:38 Ebo Gad nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ, Ramọt, nʼime Gilead nke bụ obodo mgbaba, Mahanaim,
JOS 21:39 Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
JOS 21:40 Ọnụọgụgụ obodo niile e kenyere agbụrụ Merari bụ obodo iri na abụọ, ha bụ ndị fọdụrụ na ndị Livayị.
JOS 21:41 Ọnụọgụgụ obodo niile na ebe ịta nri nke anụ ụlọ e sitere nʼala ụmụ Izrel nye ndị Livayị dị iri anọ na asatọ.
JOS 21:42 Obodo ọbụla nwere ala gbara ya gburugburu ebe anụ ụlọ ga-anọ kpaa nri.
JOS 21:43 Ya mere, Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel ala ahụ ọ ṅụrụ iyi inye ndị nna nna ha. Ha nwetara ya, biri nʼime ya.
JOS 21:44 Onyenwe anyị nyere ha izuike nʼakụkụ niile, dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye ndị nna nna ha. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị iro ha ọbụla guzogidere ha, nʼihi na Onyenwe anyị nyefere ndị iro ha niile nʼaka ha.
JOS 21:45 O nweghị otu nʼime nkwa ọma niile Onyenwe anyị kwere Izrel nke na-emezughị. O mezuru nkwa niile o kwere ha.
JOS 22:1 Emesịa, Joshua kpọkọtara ndị agha si nʼebo Ruben, na Gad, na ọkara Manase, gwa ha okwu sị:
JOS 22:2 “Unu emeela ihe niile Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼiwu. Unu egeela ntị nʼolu m, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu.
JOS 22:3 E, unu arụzuola ọrụ ahụ Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ahapụghị ụmụnna unu nʼọgbọ agha ogologo ụbọchị ndị a niile.
JOS 22:4 Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke unu enyela ụmụnna unu mmeri. O meekwala ka ha zuru ike dịka o kwere nkwa na ọ ga-eme. Ugbu a, laghachinụ nʼụlọ unu, laghachikwanụ nʼala unu, ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.
JOS 22:5 Ma lezienụ anya nke ọma idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu: nke bụ ịhụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, ịga ije nʼirube isi nye ya, irube isi nʼiwu ya niile, ịdabere na ya, na iji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile fee ya ofufe.”
JOS 22:6 Ya mere, Joshua gọziri ha, zipụ ha, ha lakwara nʼụlọ nke aka ha.
JOS 22:7 Ọkara ebo Manase ka Mosis nyere ihe nketa nke ha nʼime ala Bashan, ma ọkara ebo Manase nke ọzọ nwetara ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Mgbe Joshua na-ezilaga ha nʼụlọ ha, ọ gọziri ha, gwa ha okwu sị,
JOS 22:8 “Werenụ ọtụtụ akụ unu lụtara nʼagha laa. Mgbe unu ruru, kenyenụ ndị ikwu unu ụfọdụ ihe site nʼime akụ ndị iro unu a.” Nʼihi na ihe ha kwatara nʼagha dị ukwuu: igwe anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo, na bronz, na igwe, na uwe dị iche iche.
JOS 22:9 Ya mere, ndị agha Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase, hapụrụ ndị agha Izrel na Shaịlo, nʼime ala Kenan, nʼofe osimiri Jọdan, laghachi nʼala nke ha dị na Gilead, nke ha nwetara dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
JOS 22:10 Mgbe ha rutere Gelilọt dị nʼakụkụ Jọdan, nʼala ndị Kenan, ụmụ Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase wuru ebe ịchụ aja dị ukwu nʼebe ahụ nʼakụkụ Jọdan.
JOS 22:11 Mgbe ndị Izrel nụrụ na ha e wuola ebe ịchụ aja nʼoke ala Kenan, na Gelilọt, nʼebe dị nso Jọdan, nʼofe ala ndị Izrel,
JOS 22:12 ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo, jikere ịga ibuso ụmụnna ha ahụ agha.
JOS 22:13 Ya mere, ụmụ Izrel zigara Finehaz, nwa Elieza, bụ onye nchụaja ka ọ ga nʼala Gilead, ya bụ ijekwuru ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase.
JOS 22:14 Ndị so Finehaz nʼozi a bụ ndị ndu iri. Otu onyendu sitere nʼotu ebo, nʼime ebo iri nke ụmụ Izrel.
JOS 22:15 Mgbe ndị a rutere nʼala Gilead, ha kpọkọtara ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase gwa ha okwu sị,
JOS 22:16 “Otu a ka ọgbakọ niile nke Onyenwe anyị sịrị, ‘Olee ụdị njehie dị nke a, nke unu mere megide Chineke? Olee otu unu si wezuga onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, gaa wuore onwe unu ebe ịchụ aja, si otu a nupu isi megide ya?
JOS 22:17 Ọ pụtara na mmehie Peoa ezubereghị anyị? Ruo taa anyị asachapụbeghị onwe anyị site na mmehie ahụ, ọ bụ ezie nʼọrịa na-efe efe dakwasịrị nzukọ nke Onyenwe anyị.
JOS 22:18 Ugbu a, unu na-achọkwa isite nʼebe Onyenwe anyị nọ chigharịa. “ ‘Ọ bụrụ na unu enupu isi megide Onyenwe anyị taa, matakwanụ na echi ya, ọ ga-eweso nzukọ Izrel niile iwe.
JOS 22:19 Ọ bụrụ na unu wuru ebe ịchụ aja ahụ nʼihi na ala unu rụrụ arụ, bịakwutenụ anyị nʼakụkụ nke ọzọ, nke osimiri a, ebe Onyenwe anyị bi nʼetiti anyị, nʼime ụlọ nzute obibi ya. Anyị ga-ekenyekwa unu ala anyị. Ma unu enupula isi megide Onyenwe anyị site nʼiwu ebe ịchụ aja ọzọ, ebe ọ bụ na e nwere otu ebe bụ ezi ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke anyị.
JOS 22:20 Mgbe Ekan, nwa Zera, zipụtara onwe ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe metụtara ihe e doro nsọ, ọ bụ na nzukọ Izrel niile esoghị keta oke nʼahụhụ dakwasịrị ya? Ọ bụghị naanị ya nwụrụ nʼihi mmehie ahụ.’ ”
JOS 22:21 Nke a bụ nzaghachi ụmụ Ruben, na ụmụ Gad na ọkara ebo ụmụ Manase, nyere ndị ndu ụmụ Izrel niile;
JOS 22:22 “Chineke onye kachasị chi niile, bụ Onyenwe anyị! Chineke onye kachasị chi niile, bụ Onyenwe anyị! Ya onwe ya maara, ka Izrel niile matakwa. A sị na nke a bụ nnupu isi, a sịkwarị na ọ bụ enweghị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, unu ahapụla anyị ka anyị dịrị ndụ.
JOS 22:23 Ọ bụrụ na anyị sitere na nnupu isi wuo ebe ịchụ aja a maka ịchụ aja udo maọbụ aja mkpụrụ ọka, ka Onyenwe anyị nʼonwe ya taa anyị ahụhụ.
JOS 22:24 “Ma nke ahụ abụghị ihe anyị bu nʼobi! Anyị wuru ya nʼihi na anyị tụrụ ụjọ na nʼoge dị nʼihu, ụmụ unu ga-agwa ụmụ anyị okwu sị, ‘Gịnị ka unu na Onyenwe anyị, Chineke Izrel nwekọrọ?
JOS 22:25 Onyenwe anyị e jirila osimiri Jọdan kpaa oke nʼetiti anyị na unu, unu ụmụ Ruben na Gad. Unu enweghị oke nʼime Onyenwe anyị!’ Nʼụzọ dị otu a, ụmụ unu nwere ike ime ụmụ anyị ka ha kwụsị ịtụ egwu Onyenwe anyị.
JOS 22:26 “Ọ bụ nke a mere anyị ji kpebie sị, ‘Ka anyị jikere wuo ebe ịchụ aja, ma ọ bụghị ebe ịchụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ndị ọzọ,’
JOS 22:27 Kama, ọ bụ ebe ịchụ aja ịhụba ama nʼetiti unu na anyị, nakwa ọgbọ ndị nke ga-esote anyị, na anyị ga-efe Onyenwe anyị ofufe nʼụlọnsọ ya, site na ịchụrụ ya aja nsure ọkụ, na aja udo. Mgbe ahụ, nʼoge dị nʼihu, ụmụ ụmụ unu agaghị asị ụmụ ụmụ anyị, ‘Unu enweghị oke nʼime Onyenwe anyị Chineke.’
JOS 22:28 “Echiche obi anyị bụ na ọ bụrụ na ụmụ ụmụ unu ekwuo ihe dị otu a, ụmụ anyị ga-azaghachi ha sị, ‘Lee ebe ịchụ aja nna anyị ha wuru, nke yiri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị. E wughị ya maka ịchụ aja nsure ọkụ, kama e wuru ya dịka ihe ama na-egosi nnwekọ dị nʼetiti anyị na unu.’
JOS 22:29 “Anyị agaghị enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ; anyị agaghị esitekwa nʼiso Onyenwe anyị Chineke wezuga onwe anyị, site nʼiwuru onwe anyị ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka maọbụ ụdị aja ọzọ dị iche iche. Ebe ịchụ aja anyị maara bụ ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke anyị, nke guzo nʼihu ụlọ nzute ya.”
JOS 22:30 Mgbe Finehaz onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ ahụ, bụ ndịisi ezinaụlọ ndị Izrel nụrụ ihe ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ụmụ Manase kwuru, ọ masịrị ha.
JOS 22:31 Ya mere, Finehaz nwa Elieza, bụ onye nchụaja, sịrị Ruben, na Gad, na Manase, “Taa ka anyị maara na Onyenwe anyị nọ nʼetiti anyị, nʼihi na unu emehieghị megide Onyenwe anyị dịka anyị chere. Ya mere, unu azọpụtala ndị Izrel site na mbibi gaara abịakwasị ha site nʼaka Onyenwe anyị.”
JOS 22:32 Mgbe ahụ Finehaz, nwa Elieza, onye nchụaja, na ndị ndu ahụ laghachitere Kenan site na nzukọ ha na ụmụ Ruben na Gad na ọkara Manase mere nʼala Gilead kọọrọ Izrel ihe ha gatara.
JOS 22:33 Okwu a tọrọ ụmụ Izrel ụtọ. Ha ṅụrịrị ọṅụ, too Chineke otuto. Ha ekwukwaghị okwu ibu agha megide ụmụ Ruben, ụmụ Gad na ụmụ Manase, banyere ibibi ala ha bi nʼime ya.
JOS 22:34 Ya mere, ụmụ Ruben na ụmụ Gad kpọrọ ebe ịchụ aja ha wuru, “Ebe ịchụ aja akaebe,” nʼihi na ha sịrị, “Ọ bụ ihe akaebe igosi mmadụ niile na Onyenwe anyị bụkwa Chineke anyị.”
JOS 23:1 Ma mgbe ọtụtụ oge gasịrị, site nʼoge Onyenwe anyị mere ka Izrel nwee ezumike nʼebe ndị iro gbara ha okirikiri nọ, Joshua aghọọla agadi, gbaa ọtụtụ afọ.
JOS 23:2 Ya mere, Joshua kpọrọ ndị Izrel niile, ndị okenye ha, ndị ndu ha, ndị odozi okwu ha na ndịisi ha, sị ha, “Emeela m agadi gbaakwa ọtụtụ afọ.
JOS 23:3 Unu onwe unu ejirila anya unu hụ ihe niile Onyenwe anyị Chineke unu mere mba ndị a niile, nʼihi unu. Ọ lụụrụ unu ọgụ, nyere unu aka imeri ndị iro unu.
JOS 23:4 Unu hụrụ na ekekwarala m unu ala mba ahụ niile nke fọdụrụnụ ka ha bụrụ ihe nketa ebo unu, site na Jọdan, tinyekwara mba niile ndị ahụ m kpochapụrụ nʼakụkụ osimiri Mediterenịa dị na mpaghara ọdịda anyanwụ.
JOS 23:5 Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akwapụ ndị bi nʼime ha nʼihi unu. Ọ ga-achụpụ ha nʼihu unu, mee ka unu nweta ala ha, dịka Onyenwe anyị Chineke unu kwere unu nkwa.
JOS 23:6 “Ya mere, dịnụ ike, lezienụ anya idebezu na irube isi nʼihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu Mosis. Unu esila nʼime ya wezuga onwe unu nʼụzọ ọbụla.
JOS 23:7 Lezienụ anya ka unu na mba ndị a fọdụrụ nʼala a ghara inwe mmekọ ọbụla. Unu akpọtụkwala chi ha niile aha. Unu aṅụkwala iyi nʼaha ha, maọbụ fee ha ofufe, maọbụ kpọọ isiala nye ha.
JOS 23:8 Kama raparanụ nʼahụ Onyenwe anyị Chineke unu dịka unu mere ruo taa.
JOS 23:9 “Onyenwe anyị achụpụla mba dị ukwuu na mba siri ike site nʼebe unu nọ. O nwekwaghị otu mba nʼime ha o kwere ka ha merie unu.
JOS 23:10 Otu nwoke nʼime unu achụọla puku ndị ikom ndị iro unu ọsọ. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu alụọlara unu ọgụ, dịka ya onwe ya kwere nkwa.
JOS 23:11 Nʼihi ya, lezienụ onwe unu anya nke ọma ka unu hụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya.
JOS 23:12 “Ma ọ bụrụ na unu alaghachi azụ, ma kwere ka e jikọọ unu na mba ndị a fọdụrụ nʼetiti unu. Ọ bụrụ na unu na ha ebido ịlụrịta di na nwunye, na-emekọrịta ihe ọnụ,
JOS 23:13 maranụ nke ọma, na Onyenwe anyị Chineke unu agaghị achụpụrụ unu mba ndị a site nʼala unu. Kama ha ga-abụrụ unu igbudu na ọnya. Ha ga-abụkwara unu apịpịa nʼakụkụ unu, na ogwu nʼanya unu, ruo mgbe unu ga-ala nʼiyi nʼezi ala a, nke Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu.
JOS 23:14 “Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m ga-agbaso ụzọ ahụ ndị niile bi nʼụwa na-aghaghị ịgbaso. Unu niile maara nʼime obi unu na nʼime mkpụrụobi unu na o nweghị otu nʼime nkwa ọma Onyenwe anyị Chineke unu kwere nye unu nke na-emezughị. E mezuola nkwa ndị a niile; o nweghị nke ọbụla a na-emezughị.
JOS 23:15 Ma dịka ezi nkwa niile Onyenwe anyị Chineke unu kwere si bụrụ ihe e mezuru emezu, otu a kwa ka Onyenwe anyị ga-esi mee ka ihe ọjọọ niile ọ bara mba ya mezuo nʼisi unu, tutu ruo mgbe o mere ka unu laa nʼiyi nʼezi ala ahụ ọ na-enye unu.
JOS 23:16 Ọ bụrụ na unu emebie ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, nke o nyere unu iwu idebe, tụgharịa malite ịgbaso na ife chi ndị ọzọ na ịkpọ isiala nye ha, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, unu ga-alakwa nʼiyi ngwangwa nʼala ọma ahụ o nyere unu.”
JOS 24:1 Joshua kpọkọtara ebo Izrel niile na Shekem. Ọ kpọrọ ndị okenye Izrel na ndịisi ha na ndị ikpe ha na ndị nlekọta ha. Ha niile bịara chee onwe ha nʼihu Chineke.
JOS 24:2 Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị Izrel niile sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nna nna unu ochie ha, nke bụ Tera, nna Ebraham, na Nahọ, bikwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ofe osimiri Yufretis, ebe ha nọ fee chi ndị ọzọ ofufe.
JOS 24:3 Ma mụ onwe m kpọpụtara nna nna unu Ebraham site nʼala ahụ dị nʼofe osimiri dubata ya nʼala Kenan, nye ya ọtụtụ ụmụ ụmụ, site na nwa ya bụ Aịzik.
JOS 24:4 Ụmụ m nyere Aịzik bụ Jekọb na Ịsọ. Ịsọ ka m nyere ala ugwu ugwu Sia, ka o nweta ma Jekọb na ezinaụlọ ya gara nʼala Ijipt.
JOS 24:5 “ ‘Emesịa, ezigara m Mosis na Erọn, ma wetara ndị Ijipt ihe otiti ọjọọ niile dị iche iche site nʼihe m mere nʼebe ahụ. Nʼikpeazụ, akpọpụtara m ndị m site nʼala Ijipt.
JOS 24:6 Ma mgbe unu rutere nʼOsimiri Uhie, ndị agha Ijipt gbapụtara chịrị ụgbọ agha ha na ndị agha na-agba ịnyịnya ha chụwa unu ọsọ.
JOS 24:7 Mgbe ndị Izrel hụrụ ha, ha tiri mkpu kpọkuo Onyenwe anyị. O tinyere oke ọchịchịrị nʼetiti unu na ndị Ijipt. O mere ka oke osimiri kpuchie ha, mee ka ha mikpuo nʼosimiri ahụ. Unu niile hụkwara ihe m mere ndị Ijipt. Emesịa, unu bikwara nʼọzara ọtụtụ afọ.
JOS 24:8 “ ‘Ma emesịa, emere m ka unu bata nʼime ala ndị Amọrait, ndị bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha lụsoro unu ọgụ, ma eweere m ha nyefee unu nʼaka. E bibiri m ha nʼihu unu, ma unu nwetara ala ha.
JOS 24:9 Mgbe Balak nwa Zipoa, eze Moab, jikeere ibuso Izrel agha, o zigaara Belam, nwa Beoa ozi ka ọ bịa bụọ unu ọnụ.
JOS 24:10 Ma egeghị m Belam ntị. Kama emere m ya ka ọ gọzie unu. Anapụtara m unu site nʼaka ya.
JOS 24:11 “ ‘Emesịa, unu gafere osimiri Jọdan bịaruo Jeriko. Ndị ikom Jeriko busoro unu agha, otu a kwa ka ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Gigash, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ma eweere m ha niile nyefee unu nʼaka.
JOS 24:12 E zigara m ebu nʼihu unu nke chụpụrụ ha nʼihu unu, bụ eze abụọ ndị Amọrait. Ọ bụghị mma agha na ụta unu ka unu ji mee nke a.
JOS 24:13 Ya mere enyere m unu ala ahụ, nke unu na-adọgbughị onwe unu nʼihi ya, nyekwa unu ọtụtụ obodo nke unu na-ewughị, bụ ala ndị a unu bi nʼime ya ugbu a. Enyere m unu ubi vaịnị na ubi oliv nke unu na-akụghị, nke unu na-eri mkpụrụ ha.’
JOS 24:14 “Ya mere ugbu a, tụọnụ egwu Onyenwe anyị, feekwanụ ya ofufe nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi na nʼeziokwu. Wezuganụ chi ndị ahụ niile nna nna unu ha fere ofufe nʼofe osimiri Yufretis ahụ, na nʼIjipt. Feenụ naanị Onyenwe anyị ofufe.
JOS 24:15 Ọ bụrụkwanụ na ọ masịghị unu ife Onyenwe anyị, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma ọ bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe Onyenwe anyị.”
JOS 24:16 Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ Onyenwe anyị fee chi ndị ọzọ!
JOS 24:17 Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee.
JOS 24:18 Ọ bụ Onyenwe anyị chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.”
JOS 24:19 Joshua zaghachiri ndị Izrel sị, “Unu apụghị ife Onyenwe anyị ofufe; nʼihi na ọ bụ Chineke dị nsọ, bụrụkwa Chineke ekworo. Ọ gaghị agbaghara unu nnupu isi unu na mmehie unu niile.
JOS 24:20 Ọ bụrụ na unu agbakụta Onyenwe anyị azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.”
JOS 24:21 Ma ndị Izrel sịrị Joshua, “Mba, kama Onyenwe anyị ka anyị ga-efe ofufe.”
JOS 24:22 Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife Onyenwe anyị ofufe.” Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.”
JOS 24:23 Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere Onyenwe anyị Chineke Izrel isi.”
JOS 24:24 Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe Onyenwe anyị Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.”
JOS 24:25 Ya mere, Joshua na ndị Izrel gbara ndụ nʼụbọchị ahụ na Shekem. O nyere ha iwu na ụkpụrụ ha ga-edebe.
JOS 24:26 Joshua dere iwu ndị a ụmụ Izrel kwere na ha ga-eme nʼAkwụkwọ Iwu Chineke. Emesịa, o bupụtara otu nkume buru ibu guzo ya nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼakụkụ ebe nsọ Onyenwe anyị.
JOS 24:27 Joshua sịrị ndị ahụ niile, “Lee, nkume a ga-abụ ihe ama megide anyị. Nʼihi na ọ nụla okwu niile nke Onyenwe anyị gwara anyị. Ọ ga-abụkwa ihe ama megide unu, ma ọ bụrụ na unu mee ihe mmekpu megide Chineke unu.”
JOS 24:28 Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha.
JOS 24:29 Ọ dịghị anya, mgbe ihe ndị a gasịrị, Joshua nwa Nun, odibo Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ na iri.
JOS 24:30 E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, na Timnat Sera, nʼime ala ugwu ugwu Ifrem, nʼakụkụ ugwu dị nʼala Gaash.
JOS 24:31 Ndị Izrel fere Onyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, ndị maakwara ihe niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel.
JOS 24:32 Ọkpụkpụ Josef ndị Izrel chịtara mgbe ha si nʼala Ijipt pụta, ka ha liri na Shekem, nʼime ala ahụ Jekọb zụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha nʼaka ụmụ Hamọ nna Shekem. Ala a ghọrọ nʼihe nketa ụmụ Josef.
JOS 24:33 Elieza nwa Erọn, nwụkwara. E liri ya nʼala ugwu ugwu ndị Ifrem, na Gibea, obodo e nyere nwa ya bụ Finehaz.
JDG 1:1 Mgbe Joshua nwụrụ, ụmụ Izrel jụrụ Onyenwe anyị sị, “Olee ebo ga-ebu ụzọ gaa lụso ndị Kenan agha nʼihi anyị?”
JDG 1:2 Onyenwe anyị zara, “Ọ bụ ebo Juda. Enyefeela m ala ahụ nʼaka ha.”
JDG 1:3 Ndị Juda gwara ụmụ nwanne ha ndị ebo Simiọn sị, “Soronụ anyị banye nʼala ahụ anyị ketara site nʼife nza, ka anyị ga lụso ndị Kenan agha. Anyị ga-esokwara unu banye nʼala nke unu.” Ya mere, ndị ebo Simiọn soro ha gaa.
JDG 1:4 Mgbe Juda busoro ha agha, Onyenwe anyị nyefere ndị Kenan, na ndị Periz nʼaka ha, mee ka ha gbuo puku ndị agha iri nʼime obodo Bezek.
JDG 1:5 Nʼebe ahụ ka ha zutere Adoni-Bezek, buso ya agha, tigbukwaa ndị Kenan na ndị Periz.
JDG 1:6 Ma Adoni-Bezek gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya, ma ha chụgidere ya, jide ya, gbupụ ya isi mkpụrụ aka ya abụọ na isi mkpụrụ ụkwụ ya abụọ.
JDG 1:7 Mgbe ahụ, Adoni-Bezek sịrị, “Iri ndị eze asaa ka m mesoro ụdị mmeso a unu mesoro m, ọ bụkwa nri si na tebul m dapụ ka ha riri. Ugbu a Chineke akwụghachila m ụgwọ ọrụ ọjọọ m.” Ha kpụụrụ ya gaa Jerusalem, ebe ọ nọ nwụọ.
JDG 1:8 Ndị Juda busoro obodo Jerusalem agha, were mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi nʼime ya, ma gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ.
JDG 1:9 Mgbe nke a gasịrị, ndị agha Juda busoro ndị Kenan bi na ndịda ala ugwu ugwu ahụ, bụ Negev, ya na akụkụ ọdịda anyanwụ nʼebe dị ala ala.
JDG 1:10 Ha jekwuru ndị Kenan bi nʼobodo Hebrọn (nke a na-akpọ Kiriat Aaba na mbụ) merie Sheshai, na Ahiman, na Talmai.
JDG 1:11 Site nʼebe ahụ, ha jekwuru ndị bi na Debịa (nke a na-akpọ Kiriat Sefa, nʼoge mbụ).
JDG 1:12 Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.”
JDG 1:13 Otniel nwa Kenaz, nwanne nta Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.
JDG 1:14 Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”
JDG 1:15 Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.
JDG 1:16 Ụmụnna nwunye Mosis, onye Ken, si nʼobodo nkwụ nkwụ soro ndị Juda, gaa biri nʼetiti ndị ahụ bi nʼọzara Juda, na Negev, nke dị nso nʼArad.
JDG 1:17 Ndị ikom Juda sooro ndị ikom Simiọn, ụmụnna ha, lụso ndị Kenan bi na Zefat agha, bibie obodo ahụ kpamkpam. Nʼihi nke a, a gụgharịrị obodo ahụ, kpọọ ya Homa.
JDG 1:18 Ndị agha Juda lụgbukwara obodo Gaza, na Ashkelọn, na Ekrọn, tinyere ala niile gbara ha gburugburu.
JDG 1:19 Onyenwe anyị nọnyeekwara ndị Juda mee ka ha kpochapụ ndị niile bi nʼobodo niile dị nʼala ugwu ugwu ahụ. Ma ha enweghị ike ịchụpụ ndị bi nʼala ndagwurugwu ahụ, nʼihi na ndị ahụ nwere ụgbọ agha igwe dị iche iche.
JDG 1:20 E nyekwara Kaleb obodo Hebrọn, dịka Mosis kwere ya na nkwa. Kaleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ site nʼala ahụ.
JDG 1:21 Ndị ebo Benjamin enweghị ike chụpụ ndị Jebus bi na Jerusalem. Nʼihi nke a, ha soro ụmụ Benjamin biri ruo taa.
JDG 1:22 Ma ndị sitere nʼebo Josef busoro obodo Betel agha. Onyenwe anyị nọnyeere ha.
JDG 1:23 Mgbe ha zipuru ndị ikom ịga nyochapụta obodo Betel, nke a na-akpọ Luz,
JDG 1:24 ndị nnyopụta ahụ hụrụ otu nwoke sị nʼobodo ahụ na-apụta. Ha gwara ya okwu sị ya, “Zi anyị ụzọ anyị ga-esi banye nʼime obodo a, anyị ga-ahụ na e mesoro gị mmeso dị mma.”
JDG 1:25 Ya mere, nwoke ahụ gosiri ha ụzọ, ha ji mma agha gbuo mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ, ma ha hapụrụ nwoke ahụ na ezinaụlọ ya ndụ.
JDG 1:26 Emesịa, nwoke ahụ kpọọrọ ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Het wuoro onwe ya otu obodo nʼebe ahụ. Ọ kpọrọ aha obodo ahụ Luz, nke bụkwa aha obodo ahụ ruo taa.
JDG 1:27 Manase achụpụghị ndị Bet-Shan na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Teanak na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Doa, maọbụ Ibleam, maọbụ Megido, tinyere obodo nta niile ndị ọzọ gbara ha gburugburu. Nʼihi na ndị Kenan bigidere nʼebe ahụ.
JDG 1:28 Mgbe ụmụ Izrel dịrị ike karịa, ha manyere ndị Kenan ị rụrụ ha ọrụ, ma ha achụpụghị ha site nʼala ahụ.
JDG 1:29 Ifrem enwekwaghị ike chụpụ ndị Kenan bi na Gaza. Ndị Kenan gara nʼihu biri nʼetiti ha nʼebe ahụ.
JDG 1:30 Otu a kwa, ebo Zebụlọn achụpụghị ndị Kenan bi nʼala Kitrọn, maọbụ na Nahalol, kama ha mere ha ndị ohu na-arụ ọrụ ike.
JDG 1:31 Ọzọkwa, ndị ebo Asha achụpụghị ndị niile bi nʼAkọ, na Saịdọn, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, maọbụ Rehob.
JDG 1:32 Ndị Asha binyere nʼetiti ndị Kenan bụ ndị bi nʼala ahụ, nʼihi na ha achụpụghị ha.
JDG 1:33 Ndị ebo Naftalị achụpụghịkwa ndị bi na Bet-Shemesh, maọbụ ndị bi na Bet-Anat. Kama ndị Naftalị binyere ndị Kenan bi nʼala ahụ. Ma ndị bi na Bet-Shemesh, na Bet-Anat ghọrọ ndị ohu ndị Naftalị.
JDG 1:34 Ma banyere ndị ebo Dan, ndị Amọrait chụpụrụ ha chụba ha nʼelu ugwu. Ha ekwenyeghị ka ha rịdata na ndịda ugwu ahụ.
JDG 1:35 Ma ndị Amọrait nọgidesịrị ike nʼugwu Heres, na Aijalon, na Shaalbim, ma mgbe ike ebo Josef bara ụba, ha meriri ha, mee ha ndị ohu ha.
JDG 1:36 Oke ala ụmụ ndị Amọrait malitere na mgbago Akrabim ruo, ma gafeekwa ebe a na-akpọ Sela.
JDG 2:1 Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere na Gilgal bịa Bokim gwa ndị Izrel okwu sị ha, “Mụ onwe m kpọpụtara unu site nʼIjipt, kpọbata unu nʼala a dịka m kwere nna unu ha na nkwa. Asịrị m, ‘Agaghị m ala azụ imezu ọgbụgba ndụ mụ na unu,
JDG 2:2 unu na ndị bi nʼobodo ahụ agbakwala ndụ ọbụla, kama unu ga-etitu ebe ịchụ aja ha.’ Ma unu erubeghị isi nʼokwu a, gịnị mere unu emeghị nke a?
JDG 2:3 Agwara m unu, na ‘agaghị m esite nʼihu unu chụpụ ha; ha ga-adịrị unu dịka ọnya nʼakụkụ niile, ebe chi niile ha ga-abụkwara unu ihe na-eweta ọnwụnwa.’ ”
JDG 2:4 Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ kwusiri okwu ndị a, ụmụ Izrel niile kwara akwa nke ukwuu.
JDG 2:5 Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Bokim. Ha chụụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ.
JDG 2:6 Mgbe Joshua zilagasịrị ndị Izrel niile, onye ọbụla nʼime ha gara nʼihe nketa ya, inweta ya, dịka ebo ọbụla dị nʼIzrel si dị.
JDG 2:7 Ndị Izrel fereOnyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, bụkwa ndị hụrụ ọrụ ukwuu niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel.
JDG 2:8 Ma Joshua, nwa Nun, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara otu narị afọ, na afọ iri.
JDG 2:9 E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, nʼobodo Timnat Heres, nʼala ugwu ugwu nke ebo Ifrem, nʼụzọ mgbago ugwu Gaash.
JDG 2:10 Emesịa, ọgbọ ahụ niile nwụrụ dịka ndị nna nna ha, ọgbọ ọzọ tolitere, ndị na-amaghị Onyenwe anyị maọbụ ihe ndị nke o mere nye ụmụ Izrel.
JDG 2:11 Mgbe ahụ, ndị Izrel mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị site nʼife Baal ofufe.
JDG 2:12 Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke ahụ, nna ha fere ofufe, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt. Ma ha malitere ife na ịsọpụrụ, na ịkpọ isiala nye ọtụtụ chi dị iche iche, bụ chi nke ndị bi ha gburugburu. Ha si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe.
JDG 2:13 Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, fee chi Baal na Ashtọret ofufe.
JDG 2:14 Ya mere, Onyenwe anyị were iwe megide Izrel, rara ha nye nʼaka ndị ji aka ike pụnara ha ihe ha nwere. O weere ha resi ndị iro ha gbara ha gburugburu, bụ ndị ha enwekwaghị ike iguzogide.
JDG 2:15 Dịka ọ ṅụrụ ya nʼiyi nye ha, mgbe ọbụla ụmụ Izrel pụrụ ibu agha, aka Onyenwe anyị megidere ha ime ka ha bụrụ ndị e meriri emeri. Ọnọdụ ha jọrọ njọ nke ukwuu.
JDG 2:16 Nʼihi ọnọdụ ọjọọ a, Onyenwe anyị mere ka ndị ikpe sị nʼetiti ha pụta, ịnapụta ha site nʼaka ndị a ji ike na-apụnara ha ihe ha nwere.
JDG 2:17 Ma ụmụ Izrel egeghị ndị ikpe ahụ ntị, kama ha nọgidere na-akpọ isiala nye ma na-agbasokwa chi ndị ọzọ. Dịka nna nna ha na-emeghị, ha mere ngwangwa wezuga onwe ha site nʼụzọ Onyenwe anyị, bụrụ ndị na-enupu isi nʼebe iwu Onyenwe anyị dị.
JDG 2:18 Ma mgbe ọbụla Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel onye ikpe, ọ na-anọnyere onye ikpe ahụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Ọ na-esitekwa nʼaka onye ikpe a napụta ụmụ Izrel nʼaka ndị iro ha nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼahụ ụmụ Izrel, mgbe ha na-asụ ude, nʼihi mmegbu na mkpagbu niile ndị iro ha na-emegbu ha, ma na-akpagbukwa ha.
JDG 2:19 Ma mgbe ọbụla onye ikpe a nwụrụ, ụmụ Izrel na-alaghachi azụ biwe ndụ ọjọọ karịa nke nna nna ha ochie. Ha na-agbaso chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala nye ha, na ife ha ofufe. Ha jụrụ iwezuga agwa ọjọọ ha ndị a ma ọ bụkwa ụzụ isiike ha.
JDG 2:20 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Izrel, ma sị, “Nʼihi na mba a emebiela ọgbụgba ndụ ahụ m nyere nna ha nʼiwu, jụkwa ige m ntị,
JDG 2:21 agaghị m achụpụkwa site nʼihu ha mba ndị ahụ Joshua hapụrụ mgbe ọ nwụrụ.
JDG 2:22 Aga m eji ha nwalee Izrel, ịchọpụta ma ha ga-elezi anya idebe ụzọ Onyenwe anyị, gaakwa ije nʼime ya dịka nna nna ha mere m.”
JDG 2:23 Onyenwe anyị hapụrụ mba ndị ahụ niile ka ha nọgide. Ọ chụpụghị ha ngwangwa site na inyefe ha nʼaka Joshua.
JDG 3:1 Ndị a bụ aha mba dị iche iche Onyenwe anyị hapụrụ nʼala ahụ iji nwapụta ndị Izrel ahụ niile na-esoghị mgbe e buru agha nʼime ala Kenan.
JDG 3:2 O mere nke a naanị ka ọ kuziere ọgbọ niile ndị Izrel ibu agha, bụ ndị ahụ na-amabeghị ihe agha bụ nʼoge gara aga.
JDG 3:3 Ndịisi ise nke ndị Filistia, na ndị Kenan niile, ndị Saịdọn na ndị Hiv, ndị bi nʼelu ugwu Lebanọn, site nʼugwu Baal-Hemon ruo na mbata obodo Hamat.
JDG 3:4 A ga-esite na ndị a nwapụta okwukwe ụmụ Izrel ma ịmata ma ha ga-edebe iwu Onyenwe anyị sitere nʼọnụ Mosis nye nna nna ha ochie.
JDG 3:5 Nʼihi nke a, ụmụ Izrel biri nʼetiti ndị Kenan, ndị Het, ndị Hiv, ndị Periz, ndị Amọrait, na ndị Jebus.
JDG 3:6 Ha lụtaara onwe ha ụmụ ha ndị inyom na nwunye, werekwa ụmụ ha ndị inyom nye ụmụ ha ndị ikom, feekwa chi ha niile ofufe.
JDG 3:7 Ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ha chefuru Onyenwe anyị Chineke ha, malite ife chi Baal, na Ashera ofufe.
JDG 3:8 Nʼihi ya, iwe ọkụ Onyenwe anyị kpaliri megide ụmụ Izrel. Ọ raara ha nye nʼaka eze Kushan Rishataim, eze Aram Naharaim, onye ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ya afọ asatọ.
JDG 3:9 Ma mgbe ụmụ Izrel kpọkuru Onyenwe anyị, o mere ka Otniel, nwa Kenaz, bilie nʼetiti ha. Otniel bụ nwa nwanne Kaleb nke nta. Ọ bụkwa ya napụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị iro ha.
JDG 3:10 Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya, nke mere ka ọ bụrụ onye ikpe ndị Izrel, ọ pụrụ ibu agha. Onyenwe anyị nyefere Kushan Rishataim bụ eze ndị Aram nʼaka Otniel, onye ike ya karịrị nke ya.
JDG 3:11 Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, udo dịịrị nʼala niile iri afọ anọ, mgbe Otniel na-ekpe Izrel ikpe. Nʼikpeazụ, Otniel, nwa Kenaz nwụrụ.
JDG 3:12 Ụmụ Izrel bidoro ime ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. Ya mere, Onyenwe anyị nyefere ha nʼaka Eglọn, eze Moab.
JDG 3:13 Ọ kpọtara ndị Amọn na ndị Amalek ka ha dịnyere ya. Eglọn bịara buso ndị Izrel agha, nweta obodo Nkwụ, ya abụrụzia nke ha.
JDG 3:14 Afọ iri na asatọ site nʼoge ahụ ka ụmụ Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị Eglọn, eze Moab.
JDG 3:15 Ma mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị banyere ọnọdụ ọjọọ ha, o zitere ha onye nzọpụta. Aha nwoke ahụ bụ Ehud, nwa Gera, onye sitere nʼagbụrụ Benjamin. Ọ bụ onye na-eme aka ekpe. Ya onwe ya bụkwa onye na-ebugara Eglọn, eze Moab, ego ụtụ niile ụmụ Izrel na-atụ kwa afọ.
JDG 3:16 Tupu ọ malite ije ya, o buru ụzọ kwadebere onwe ya mma agha nwere ihu abụọ na nzuzo. Ogologo mma ahụ ga-eru ihe dịka site nʼọnụ mkpịsịaka ruo nʼisi mbụ aka. Ehud kekwasịrị mma ahụ nʼapata ụkwụ aka nri ya, yikwasị ya uwe mwụda ya.
JDG 3:17 O bunyere Eglọn, eze Moab ego ụtụ ahụ. Eglọn bụ nwoke buru oke ibu.
JDG 3:18 Mgbe Ehud nyesịrị eze Eglọn ego ụtụ ahụ o ji bịa, o zilagara ndị butere ego ahụ.
JDG 3:19 Mgbe ọ bịaruru nso nʼobodo Gilgal, ebe arụsị dị iche iche a pịrị apị dị, ọ laghachiri azụ jekwuru eze Eglọn sị ya, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ma ọ ga-abụ na nzuzo.” Mgbe ahụ, eze zipụrụ ndị so ya nọdụ, ka ya na Ehud naanị nwee ike ịnọ kparịa ụka ha na nzuzo.
JDG 3:20 Ehud bịakwutere ya mgbe ọ nọ naanị ya nʼọnụụlọ dị nʼime nʼelu ụlọeze ya, sị, “Enwere m ozi Chineke sị m zie gị.” Dịka eze ahụ si nʼoche ya bilite ọtọ,
JDG 3:21 Ehud tinyere aka ekpe ya nʼime uwe ya, mịpụta mma ahụ nwere ihu abụọ nke o kegidere nʼapata ụkwụ aka nri ya. O weere ya mapuo eze Eglọn afọ.
JDG 3:22 Ọ bụladị isi mma ahụ sooro ihu mma ahụ mibanye nʼime afọ ukwu eze Eglọn. Ọnụ mma ahụ pụtakwara nʼazụ eze ahụ. Ehud amịpụtaghị mma ahụ, kama abụba dị nʼafọ eze ahụ kpuchiri ya.
JDG 3:23 Ya mere, Ehud pụrụ nʼezi, mechibido ya ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼọnụụlọ elu ahụ, kpọchie ha.
JDG 3:24 Mgbe ọ pụchara, ndị na-ejere eze ozi bịara chọọ ịbanye nʼụlọ ahụ. Ma mgbe ha hụrụ na a kpọchiri ọnụ ụzọ ụlọ ahụ akpọchi, ha kwuru nʼonwe ha sị, “Ọ ga-abụ na ọ na-anyụ nsị nʼụlọ mposi.”
JDG 3:25 Ma mgbe oge dị anya gasịrị ma eze apụtaghị, ha enweghị ike ijide onwe ha ọzọ. Ha weere ọtụghe ụzọ tụghee ọnụ ụzọ ahụ, hụ ebe eze ha tọgbọrọ nʼala, nwụọ.
JDG 3:26 Mgbe ahụ ha nọ na-eche, Ehud gbapụrụ. O sitere nʼebe ahụ arụsị ndị ahụ a pịrị apị dị gbafee, gbaga Seira.
JDG 3:27 Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ fụrụ opi ike nʼala ugwu ugwu Ifrem, ndị Izrel sooro ya site nʼugwu ahụ rịda, ya onwe ya na-edu ha.
JDG 3:28 Ọ sịrị ha, “Soronụ m nʼazụ, nʼihi na Onyenwe anyị enyela ndị Moab ndị iro unu nʼaka unu.” Ya mere, ha sooro ya gbadaa, gaa nọchie ụzọ niile ndị Moab nwere ike isi gafee osimiri Jọdan. Ha ekwekwaghị ka onye Moab ọbụla si nʼebe ahụ gafee.
JDG 3:29 Nʼụbọchị ahụ, ha gburu puku ndị agha Moab iri, ha niile siri ike bụrụkwa dimkpa. O nweghị otu onye gbapụrụ.
JDG 3:30 Nʼụbọchị ahụ, e mere ka Moab nọdụ nʼokpuru ndị Izrel. Ala ahụ nwere ozuzu ike na udo, iri afọ asatọ.
JDG 3:31 Mgbe Ehud chịsịrị, Shamga, nwa Anat rịgotara ịchị. O tigburu narị ndị Filistia isii. Ọ bụ ndụdụ e ji achị ehi ka o ji tigbuo ha. Ya onwe ya kwa, zọpụtara ndị Izrel.
JDG 4:1 Mgbe Ehud nwụsịrị, ụmụ Izrel mekwara ihe ọjọọ megide Onyenwe anyị.
JDG 4:2 Nʼihi ya, Onyenwe anyị renyere ha nʼaka Jabin, eze Kenan, onye chịrị nʼobodo Hazọ. Aha onyeisi ndị agha ya bụ Sisera, onye bi nʼobodo a na-akpọ Heroshet Hagoyim.
JDG 4:3 Nʼihi na o nwere narị ụgbọ agha igwe itoolu, ma megbukwaa ụmụ Izrel nke ukwu iri afọ abụọ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ka o nyere ha aka.
JDG 4:4 Nʼoge a, Debọra, bụ nwanyị na-ebu amụma, nwunye Lapidọt bụ onyendu ụmụ Izrel.
JDG 4:5 Ọ na-anọ nʼokpuru osisi nkwụ a na-akpọ Nkwụ Debọra, nke dị nʼagbata Rema na Betel, bụ nʼala ugwu ugwu Ifrem na-ekpe ikpe. Nʼebe ahụ ka ụmụ Izrel na-ejekwuru ya ka o doziere ha okwu ha niile.
JDG 4:6 O ziri ozi kpọọ Barak, nwa Abinoam, onye bi nʼobodo Kedesh, nke dị nʼime Naftalị, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị Chineke ụmụ Izrel na-enye gị iwu, ‘Gaa chịkọtaa puku ndị agha iri bụ ndị sitere nʼebo Naftalị na Zebụlọn, duru ha jeruo ugwu Taboa.
JDG 4:7 Aga m edute Sisera, ọchịagha ndị agha Jabin, mee ka ọ bịaruo nso iyi ukwu Kishọn, ya na ụgbọ agha ya niile na ndị agha ya niile ma nyefee ha nʼaka gị.’ ”
JDG 4:8 Barak sịrị ya, “Ejikeere m ịga ma ọ bụrụ na ị ga-eso m. Ọ bụrụkwanụ na ị jụ iso m, agaghị m aga.”
JDG 4:9 Debọra sịrị, “Aghaghị m isoro gị jee ma nʼihi mkpebi gị nʼihe a, nsọpụrụ agaghị abụ nke gị, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe Sisera nʼaka nwanyị.” Ya mere, Debọra biliri soro Barak jee obodo Kedesh.
JDG 4:10 Barak sitere nʼebo Zebụlọn na Naftalị kpọkọtaa ndị ikom ga-eso ya jee agha ahụ, puku ndị agha iri ndị dịnyere ya. Debọra sokwa ya jee.
JDG 4:11 Nʼoge a, Heba, onye Ken, ahapụla ndị Ken ndị ọzọ, ndị bụ ụmụ ụmụ Hobab, nwanne nwunye Mosis gaa maa ụlọ ikwu ya nʼokpuru osisi ukwu dị na Zaananim, nke dị nso Kedesh.
JDG 4:12 Mgbe ha gwara Sisera na Barak nwa Abinoam arịgorola nʼelu ugwu Taboa,
JDG 4:13 Sisera kpọkọtara ndị agha ya niile, tinyere narị ụgbọ agha itoolu ya, site na Haroshet Haroyim gaa nʼiyi ukwu Kishọn.
JDG 4:14 Mgbe ahụ, Debọra sịrị Barak, “Gaa nʼihu! Taa bụ ụbọchị nke Onyenwe anyị nyefere Sisera nʼaka gị. Ọ bụ na Onyenwe anyị apụbeghị jee nʼihu gị?” Nʼihi nke a, Barak duuru puku ndị agha iri ahụ gbada ndịda ugwu Taboa.
JDG 4:15 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jiri mma agha ya chụsaa Sisera na ndị agha ya na ụgbọ agha igwe ha nʼihu Barak. Sisera nʼonwe ya hapụrụ ụgbọ agha ya jiri ụkwụ gbapụ ọsọ.
JDG 4:16 Barak na ndị agha ya chụrụ ndị agha ahụ ọsọ, ha na ụgbọ agha igwe ha niile, chụruo ha Haroshet Hagoyim. Ha ji mma agha tigbuo ndị agha Sisera niile. Ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.
JDG 4:17 Ma Sisera gbapụrụ ọsọ gaa zoo onwe ya nʼụlọ ikwu Jael, nwunye Heba, onye Ken. Nʼihi udo dị nʼetiti eze Jabin, onye Hazọ, na ndị ezinaụlọ Heba, onye Ken.
JDG 4:18 Jael pụrụ ije zute Sisera sị ya, “Bịa Onyenwe m, bakwute m. Atụla ụjọ.” Ya mere na ọ bara nʼime ụlọ ikwu ya, o weere akwa ịchụ oyi kpuchie ya.
JDG 4:19 Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Akpịrị na-akpọ m nkụ, nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.” O meghere karama akpụkpọ mmiri ara ehi, nye ya ihe ọṅụṅụ, jirikwa akwa ahụ sachie ya.
JDG 4:20 Sisera gwara nwanyị ahụ bụ Jael okwu sị, “Guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ a. Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa jụọ gị, ‘O nwere onye gbabatara nʼebe a?’ sị ya, ‘Mba.’ ”
JDG 4:21 Ike gwụrụ nnọọ Sisera. Mgbe ahụ, ọ malitere ịrahụ ụra, Jael, nwunye Heba, wepụtara otu ǹtu e ji a kpọgide ụlọ ikwu ahụ nʼala, werekwa mkpirisi igwe nʼaka ya. O jiri nwayọọ jekwuuru Sisera ebe o dina na-arahụ ụra, kpọọ ya ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. Otu a ka Sisera si nwụọ.
JDG 4:22 Mgbe Barak bịara ịchọ Sisera, Jael jekwuru ya sị, “Bịa ka m gosi gị nwoke ahụ ị na-achọ.” Barak sooro ya jee, ma lee, Sisera anwụọlarị site na ǹtu ahụ a kpọrọ ya nʼisi.
JDG 4:23 Nʼụbọchị ahụ, Chineke meriri Jabin, eze ndị Kenan nʼihu ụmụ Izrel.
JDG 4:24 Aka ụmụ Izrel bụ nke dị ike na-adịkwa ike nke ukwu megide Jabin bụ eze Kenan ruo mgbe ha lara ya nʼiyi.
JDG 5:1 Nʼụbọchị ahụ, Debọra na Barak nwa Abinoam bụrụ abụ sị,
JDG 5:2 “Mgbe ndị ndu na-edu nʼIzrel, mgbe ndị mmadụ jikwa afọ ofufu nye onwe ha, toonu Onyenwe anyị!
JDG 5:3 “Nụrụnụ nke a, unu ndị eze, Geenụ ntị, unu ndịisi! Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-abụku Onyenwe anyị abụ. Aga m abụ abụ otuto nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.
JDG 5:4 “Onyenwe anyị, mgbe i si Sia pụta, mgbe i sitere nʼala Edọm gabiga, ụwa mara jijiji, mmiri ozuzo dị ukwuu sikwa na mbara eluigwe zodata.
JDG 5:5 E, ọ bụladị ugwu ukwu niile mara jijiji nʼihu Onyenwe anyị. Ugwu Saịnaị makwara jijiji nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel.
JDG 5:6 “Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat, nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị, ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga.
JDG 5:7 Ọ dịkwaghị ihe gara aga nʼobodo Izrel, tutu ruo mgbe m bịara, ee, mgbe m bụ Debọra bịara dịka nne nye Izrel.
JDG 5:8 Mgbe ụmụ Izrel họrọ ife chi ndị ọzọ ofufe, mgbe agha bịara nʼọnụ ụzọ ama niile, ahụghị ọ bụladị otu ụta maọbụ ùbe. E, ọ bụladị nʼetiti iri puku ndị agha anọ, a hụghị otu ngwa agha ọbụla.
JDG 5:9 Ma ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ banyere ndị na-achị ụmụ Izrel. Ndị ji obi ha niile were onwe ha nye nʼetiti ndị Izrel. Toonu Onyenwe anyị!
JDG 5:10 “Kwupụtanụ ya, unu ndị na-agba ịnyịnya ibu dị ọcha, unu ndị na-anọkwasị nʼelu akwa dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya unu, na unu ndị na-eji ukwu na-agagharị nʼokporoụzọ. Tụleenụ
JDG 5:11 olu abụ igwe mmadụ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri niile. Ha na-akọ akụkọ mmeri niile nke Onyenwe anyị, ya bụ, mmeri nke obodo nta ya niile nʼIzrel. “Mgbe ahụ, ndị nke Onyenwe anyị ridara gaa nʼọnụ ụzọ ama niile e si abata nʼobodo.
JDG 5:12 ‘Teta, teta, gị Debọra! Teta, teta, bụọ abụ. Bilie, gị Barak nwa Abinoam, bilie! Duru ndị ahụ niile ị dọtara nʼagha.’
JDG 5:13 “Ndị fọdụrụ na ndị a na-asọpụrụ rịdatara, ndị nke Onyenwe anyị bịakwutere m imegide ndị dị ike.
JDG 5:14 Ụfọdụ si Ifrem bịa, bụ ndị ahụ nwere mgbọrọgwụ nʼala ndị Amalek, ndị Benjamin sokwa pụta, ndị ndu sikwa Makia bịa, ndị na-eso ndị ndu sikwa Zebụlọn pụta.
JDG 5:15 Ndị ndu ebo Isaka pụkwutekwara Debọra. E, Isaka sokwara Barak na ndagwurugwu ahụ ka ezigara ha nʼokpuru ya. Ma nʼetiti ndị Ruben, ha nọ na-atụgharị uche.
JDG 5:16 Gịnị mere unu ji nọdụ nʼetiti ọgba atụrụ, ịnụ ụda ọja a na-egburu igwe atụrụ? Nʼetiti obodo niile nke Ruben, ka e nwere ọtụtụ ntụgharị uche.
JDG 5:17 Ndị Gilead nọgidere nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Ndị Dan nọgidekwara nʼime ụgbọ mmiri ha. Ndị Asha nọgidere nʼahụ udo nʼakụkụ ọnụ mmiri.
JDG 5:18 Ma ndị Zebụlọn na Naftalị jiri ndụ ha chụọ aja, pụọ nʼọzara ibu agha ahụ.
JDG 5:19 “Ndị eze ala Kenan bịara ọgụ na Teanak, nʼakụkụ mmiri ala Megido. Ma ha enweghị mmeri ọbụla. Ha akwataghị ọlaọcha maọbụ ihe nkwata ọzọ nʼagha.
JDG 5:20 Ọ bụladị kpakpando niile dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera.
JDG 5:21 Mmiri na-achị ọkụ nke iyi ukwu Kishọn bupụrụ ha niile. Ya mere, mkpụrụobi m gaa nʼihu, zoo ụkwụ gị nʼala, dị ike dịka ọdụm!
JDG 5:22 Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro. Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ!
JDG 5:23 Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị, ‘Bụọ Meroz ọnụ.’ ‘Bụọ ndị bi na ya ọnụ ebe ọ dị ukwuu, nʼihi na ha abịaghị nyere Onyenwe anyị aka imeri ndị iro ya.’
JDG 5:24 “Onye a gọziri karịchasịa ka Jael, nwunye Heba onye Ken bụ, e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu.
JDG 5:25 Nwoke ahụ rịọrọ mmiri, ma o nyere ya mmiri ara ehi, o ji iko kwesiri ndị a na-asọpụrụ nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.
JDG 5:26 O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ, aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ. Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi, ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya.
JDG 5:27 Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara, ka o dinara. Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ọ dara, nʼebe ahụ o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara nwụọ.
JDG 5:28 “Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anya nʼazụ oghere ịnata ikuku, o tiri mkpu, ‘Gịnị mere ụgbọala igwe ya ji anọ ọdụ ịbịa? Gịnị ji na mkpọtụ ụkwụ ụgbọala ya adawabeghị?’
JDG 5:29 Ma otu nʼime ndị inyom na-ejere ya ozi, nke makarịsịrị ibe ya nʼihe. E, ya onwe ya kwukwara sị,
JDG 5:30 ‘Ọ bụ na ha adịghị achọta ma na-ekekwa ọtụtụ ihe a kwatara nʼagha: onye agha ọbụla ga-eketa otu nwaagbọghọ, maọbụ abụọ. Sisera ga-enweta uwe nwere ọtụtụ agwa dị iche iche, uwe nwere ọtụtụ agwa ndị a kpara nke ọma uwe ndị akpaziri nke ọma maka ịnya nʼolu m, ihe ndị a niile dịka ihe nkwata nʼagha?’
JDG 5:31 “Onyenwe anyị, biko, ka ndị iro gị niile si otu a laa nʼiyi. Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nwupụta ihe dịka anyanwụ mgbe o biliri nʼike.” E nwere izuike nʼala ahụ iri afọ anọ.
JDG 6:1 Ọzọkwa, ụmụ Izrel mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi ya, Onyenwe anyị nyefere ha nʼaka ndị Midia afọ asaa.
JDG 6:2 Nʼihi na ndị Midia mekpara ha ahụ nke ukwuu, ụmụ Izrel meere onwe ha ebe obibi nʼugwu, nʼime ọgba nkume, na nʼebe e wusiri ike dị iche iche.
JDG 6:3 Mgbe ọbụla ndị Izrel ghasịrị mkpụrụ nʼubi ha, ndị Midia, ndị Amalek na ụfọdụ ndị ọzọ si nʼọwụwa anyanwụ na-abịa buso ha agha.
JDG 6:4 Ha na-ebichi ala ahụ, bibie ihe niile a kụrụ nʼubi nʼala ahụ niile ruo na Gaza. O nweghị ihe ọbụla dị ndụ ndị Izrel nwere, ma atụrụ, ma ehi, ma ịnyịnya ibu, ha na-ahapụ.
JDG 6:5 Dịka usuu igurube ka ha na-abịa, ha na anụ ụlọ ha niile, na ụlọ ikwu ha niile. Ọnụọgụgụ ha dị ukwuu ruo na-apụghị ịgụta ole ha dị, maọbụ ịnyịnya kamel ha. Ha na-abata nʼala ahụ nʼihi ibibicha ya.
JDG 6:6 Site nʼomume ọjọọ ndị a, e mere ka ụmụ Izrel bụrụ ndị dara ụbịam nke ukwuu nʼihi ọchịchị ndị Midia. Nʼikpeazụ, ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka.
JDG 6:7 Mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị nʼihi mkpagbu ndị Midia na-akpagbu ha,
JDG 6:8 Onyenwe anyị zitere onye amụma, onye gwara ha okwu sị, “Ihe a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke nke Izrel kwuru, Esi m nʼala Ijipt, ala ahụ unu bụ ndị ohu nʼime ya, kpọpụta unu.
JDG 6:9 Anapụtara m unu site nʼaka ike ndị Ijipt na site nʼaka ndị niile kpagburu unu, chụpụ ha site nʼihu unu, ma nye unu ala ha.
JDG 6:10 Agwara m unu sị, ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu. Unu efela chi niile nke ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha.’ Ma unu jụrụ ige m ntị.”
JDG 6:11 Mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara nọdụ ọdụ nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼOfra, nʼala ubi Joash, onye obodo Abieza, ebe nwa ya a na-akpọ Gidiọn nọ na-azọcha mkpụrụ ọka wiiti nʼime ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼihi na ọ na-ezo onwe ya ka ndị Midia hapụ ịhụ ya anya.
JDG 6:12 Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụtara ihe nʼebe ahụ gwa ya okwu sị, “Gị dike na dimkpa nʼagha, Onyenwe anyị nọnyeere gị.”
JDG 6:13 Gidiọn zara sị, “Biko onyenwe m, ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị nọnyeere anyị, gịnị mere ihe ndị a niile ji na-adakwasị anyị? Ebeekwanụ ka ihe ịrịbama ahụ niile dị nke nna anyị ha gwara anyị sị, ‘Ọ bụghị site nʼIjipt ka Onyenwe anyị siri gbapụta anyị?’ Ma ugbu a, Onyenwe anyị ajụla anyị, hapụ anyị nʼaka ndị Midia ka ha laa anyị nʼiyi.”
JDG 6:14 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere ya iwu sị ya, “Ngwa, jiri ike gị dị ukwuu pụọ, gaa ka ị gbapụta ụmụ Izrel site nʼaka ndị Midia. Mụ onwe m na-ezigakwa gị.”
JDG 6:15 Ma Gidiọn sịrị ya, “Biko, Onyenwe m, olee otu m ga-esi zọpụta Izrel? Lee, esi m nʼikwu dịkarịsịrị nta nʼime Manase pụta. Mụ onwe m bụkwa onye dịkarịsịrị ala nʼezinaụlọ m.”
JDG 6:16 Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Mụ onwe m ga-anọnyere gị. Ị ga-ebibikwa ndị Midia niile.”
JDG 6:17 Gidiọn zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nye m ihe ịrịbama nke ga-egosi na ọ bụ gị nʼezie na-agwa m okwu.
JDG 6:18 Biko esikwala ebe a pụọ ruo mgbe m lọghachiri weta onyinye m ga-eche nʼihu gị.” Onyenwe anyị zara sị ya, “Aga m eche ruo mgbe ị lọghachiri.”
JDG 6:19 Gidiọn mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, gbuo otu nwa ewu, sie ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha, nke ihe na-eko achịcha na-adịghị nʼime ya. Emesịa, o tinyere anụ ahụ nʼime nkata, wụnyekwa ofe nʼime ite, buru ha jekwuru Mmụọ ozi ahụ, ebe ọ nọ na-eche ya nʼokpuru osisi ook ahụ.
JDG 6:20 Mmụọ ozi nke Chineke sịrị ya, “Were anụ a na ogbe achịcha ahụ na-ekoghị eko, tụkwasị ha nʼelu nkume a, wụpụkwa ofe ahụ.” Gidiọn mere otu a.
JDG 6:21 Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ metụrụ ọnụ mkpanaka ahụ nke dị nʼaka ya nʼelu anụ na achịcha ahụ na-ekoghị eko. Ọkụ sitere nʼoke nkume ahụ nwuru, rechapụ anụ ahụ na achịcha nʼekoghị eko ahụ. Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị ahụ gbara barịị site nʼihu ya.
JDG 6:22 Mgbe Gidiọn ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, o tiri mkpu akwa sị, “Ewoo! Onyenwe m Onyenwe anyị! Ahụla m Mmụọ ozi Onyenwe anyị ihu na ihu!”
JDG 6:23 Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Udo dịrị gị, atụla egwu! Ị gaghị anwụ.”
JDG 6:24 Ya mere, Gidiọn wuuru Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, kpọọ ya, Onyenwe anyị bụ Onye Udo. Ụlọ nchụaja ahụ dịkwa nʼime obodo Ofra nʼala ndị Abieza ruo taa.
JDG 6:25 Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Were oke ehi nna gị, bụ oke ehi nke abụọ, nke gbara afọ asaa. Dọtuo ebe ịchụ aja nna gị wuru maka Baal, gbutukwaa ogidi osisi Ashera dị nʼakụkụ ya.
JDG 6:26 Mgbe ahụ, wuoro Onyenwe anyị bụ Chineke gị ebe ịchụ aja, nʼelu ebe a dị oke elu. Jiri osisi Ashera ahụ nke ị gbuturu kwanye ọkụ, chụọ oke ehi nke abụọ ahụ dịka aja nsure ọkụ.”
JDG 6:27 Ya mere, Gidiọn duuru mmadụ iri site na ndị na-ejere ya ozi, ndị nyeere ya aka imezu ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Kama, site nʼegwu maka ndị ikwu nna ya, na ndị bi nʼobodo ahụ, o mere ihe ndị a niile nʼime abalị.
JDG 6:28 Mgbe chi bọrọ, mgbe ndị obodo ahụ malitere ijegharị, ha hụrụ na a kwatuola ebe ịchụ aja Baal, hụkwa na e gbutuola ogidi osisi Ashera dị nʼakụkụ ya, ma werekwa oke ehi nke abụọ chụọ aja nʼelu ebe ịchụ aja ọhụrụ ahụ!
JDG 6:29 Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Onye mere ihe dị otu a?” Mgbe ha ji nwayọọ jụgharịa ajụjụ, a gwara ha sị, “Ọ bụ Gidiọn nwa Joash mere ya.”
JDG 6:30 Ndị obodo ahụ sịrị Joash, “Kpụpụta nwa gị. Ọ ga-anwụrịrị, nʼihi na ọ kwadala ebe ịchụ aja Baal, gbutuo ogidi osisi Ashera, nke dị nʼakụkụ ya.”
JDG 6:31 Ma Joash tinyere ọnụ jụọ ha ajụjụ sị ha, “Baal, ọ gwara unu na ọ chọrọ ka unu nyere ya aka? Unu na-achọ ịzọpụta ya? Onye ọbụla wepụtara onwe ya maka ịlụrụ Baal ọgụ ga-anwụ tupu chi echi abọọ. Ọ bụrụ nʼezie na Baal bụ chi, hapụnụ ya ka o tigbuo onye ahụ mebiri ebe ịchụ aja ya.”
JDG 6:32 Ya mere, nʼụbọchị ahụ, ha malitere ịkpọ Gidiọn “Jerub-Baal.” Ha kwuru sị, “Ka Baal lụọrọ onwe ya ọgụ,” nʼihi na ọ kwadara ebe ịchụ aja Baal.
JDG 6:33 Mgbe na-adịghị anya, usuu ndị agha Midia, na ndị Amalek, na obodo niile gbara ha gburugburu jikọtara onwe ha nʼotu, bịa ibu agha megide ụmụ Izrel. Ha niile gafere osimiri Jọdan, bịaruo na Ndagwurugwu Jezril ebe ha mara ụlọ ikwu.
JDG 6:34 Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Gidiọn. Ọ fụrụ opi ike nke o ji kpọkọta ndị agha ka ha zukọọ. Ndị agha niile si nʼikwu Abieza pụkwutere ya.
JDG 6:35 Otu aka ahụ, o zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru ndị agha ndị Manase, na nke ndị Asha, na nke ndị Zebụlọn, na nke ndị Naftalị, ịkpọ ha ka ha bịa soro ya gaa ibu agha. Ha niile kwenyere pụkwute ya maka agha ahụ.
JDG 6:36 Gidiọn sịrị Chineke, “Ọ bụrụ nʼezie na ị ga-azọpụta Izrel site nʼaka m dịka i kwere na nkwa,
JDG 6:37 lee, aga m edebe ajị anụ nʼebe ịzọcha ọka. Ọ bụrụ na igirigi adakwasị naanị nʼelu ajị anụ ahụ ma ala ebe ọ tọgbọ gbakọọ agbakọ, mgbe ahụ aga m amata na ị ga-anapụta Izrel site nʼaka m, dịka ị kwuru.”
JDG 6:38 Ihe a mezukwara dịka Gidiọn si rịọọ ya. Mgbe chi bọrọ, ọ gara welite ajị anụ ahụ chọpụta na o jupụtara na mmiri. Mmiri o si na ya pịpụta juru otu efere miri emi.
JDG 6:39 Mgbe ahụ, Gidiọn sịrị Chineke, “Ka iwe gị ghara ịdị ọkụ megide m. Ka m rịọkwuo naanị otu ihe ọzọ. Kwere ka m jiri ajị anụ a nwalee otu ugboro ọzọ, kama nʼoge a, mee ka mmiri ghara ịdị nʼajị anụ ahụ, ma ka igirigi jupụta nʼala ebe ọ tọgbọ.”
JDG 6:40 Nʼabalị ahụ, Chineke mere otu a. Ala niile gbaa gburugburu dere mmiri site nʼigirigi, ma mmiri ọbụla adịghị nʼajị anụ ahụ.
JDG 7:1 Jerub-Baal, onye bụkwa Gidiọn, na ndị agha ya niile biliri nʼisi ụtụtụ, maa ụlọ ikwu ha nʼisi iyi Harod. Ma ndị agha Midia mara ụlọ ikwu nke ha nʼakụkụ ugwu ebe ndị Izrel nọ, nʼime ndagwurugwu nke dị nso nʼugwu nta More.
JDG 7:2 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Lee, ndị ikom gị dị ọtụtụ. Agaghị m enyefe ndị Midia nʼaka ha, ma ọ bụghị otu a, Izrel ga-anya isi megide m, sị, ‘Ike aka m azọpụtala m.’
JDG 7:3 Ugbu a, maa ọkwa nye ndị agha sị ha, ‘Onye ọbụla ụjọ na-atụ, ya hapụ ugwu Gilead laghachi azụ.’ ” Nʼihi nke a, iri puku ndị agha abụọ na abụọ laghachiri azụ nʼụlọ nke aka ha. Ma ndị agha dị puku iri nʼọnụọgụgụ fọdụrụ.
JDG 7:4 Ma Onyenwe anyị gwara Gidiọn, sị ya, “Lee, ndị agha gị ka dị ọtụtụ. Duru ha gbada na mmiri ala, m ga-anwale ha ma webilatara gị ọnụọgụgụ ha nʼebe ahụ. Ọ bụrụ na m sị, ‘Onye nke a ga-eso gị jee,’ ọ ga-eje, ma ọ bụrụ na m sị, ‘Onye nke a agaghị eso gị jee,’ ọ gaghị eso jee.”
JDG 7:5 Ya mere, Gidiọn duuru ha bịa na mmiri ala ahụ. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị gwara ya okwu sị ya, “Kewapụ ndị ji ire ha rachara mmiri dịka nkịta, site na ndị ahụ gburu ikpere nʼala ịṅụ mmiri.”
JDG 7:6 Ọ bụ naanị narị ndị agha atọ ji ọbụ aka ha kwọlịte mmiri ha ṅụrụ. Ma ndị agha fọdụrụ gburu ikpere ha abụọ nʼala tinye ọnụ ha na mmiri, ṅụọ mmiri.
JDG 7:7 Onyenwe anyị sịrị Gidiọn, “Ọ bụ narị ndị ikom atọ ndị a raara mmiri ka m ga-eji zọpụta gị, ma rarakwa ndị Midia nye gị nʼaka. Zilaga ndị fọdụrụ ka ha laa nʼụlọ nke aka ha.”
JDG 7:8 Gidiọn zilagara ndị Izrel ndị a nʼụlọ ikwu ha ma hapụ naanị narị mmadụ atọ ndị napụtara ndị ahụ na-ala ala ngwongwo niile ha ji ebu agha, na opi ike. Ndị Midia mara ụlọ ikwu ha na ndagwurugwu, nʼebe na-adịghị anya site nʼebe Gidiọn nọ.
JDG 7:9 Nʼabalị ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Bilie, gaa lụso ọmụma ụlọ ikwu ahụ agha, nʼihi na ana m aga inyefe ha nʼaka gị.
JDG 7:10 Ma ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị ibuso ha agha, duru Pura onyeozi gị gaa nso nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ,
JDG 7:11 ṅaa ntị, nụrụ ihe ha na-ekwu. Emesịa, ị ga-abụ onye a gbara ume ibu agha megide ọmụma ụlọ ikwu ahụ.” Ya mere, ya na Pura onyeozi ya gara nʼebe dị nso, nʼebe ndị nche ọmụma ụlọ ikwu ahụ nọ.
JDG 7:12 Ma lee, usuu ndị agha Midia, na ndị Amalek, na ndị obodo ndị ọzọ ahụ si nʼọwụwa anyanwụ bịa jupụtara na ndagwurugwu ahụ dị ka igurube. Nʼezie, ịnyịnya kamel ha dị ọtụtụ, dịka aja dị nʼakụkụ oke osimiri.
JDG 7:13 Gidiọn rutere mgbe otu onye nọ na-akọrọ enyi ya banyere nrọ ọ rọrọ. Ọ na-asị, “Arọrọ m nrọ, ebe otu ogbe achịcha dị gburugburu, e ji ọka balị mee dabatara nʼime ụlọ ikwu ndị Midia. O ji ike dị egwu tie ụlọ ikwu a, nke mere na ụlọ ikwu a dajiri, kpuo ihu nʼala.”
JDG 7:14 Onye ibe ya zara sị, “Nke a abụghị ihe ọzọ karịa mma agha Gidiọn nwa Joash, onye Izrel na-aga ịbịakwute anyị nʼebe a. Chineke enyefeela ndị Midia na ụlọ ikwu ya niile nʼaka ya.”
JDG 7:15 Mgbe Gidiọn nụrụ nrọ ahụ, na nkọwa ya, ọ kpọrọ isiala kelee Chineke. Ọ laghachiri na ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel sị ha, “Bilienụ ọtọ! Nʼihi na Onyenwe anyị enyefeela unu ọmụma ụlọ ikwu ndị Midia nʼaka.”
JDG 7:16 O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, nyekwa onye ọbụla nʼime ha opi ike, na ite aja nke iheọkụ dị nʼime ya.
JDG 7:17 Ọ sịrị ha, “Unu na-ele m anya, meekwa ihe m na-eme. Mgbe anyị bịaruru nso na mpụta ebe ụlọ ikwu ahụ dị, meenụ ihe ọbụla unu hụrụ m mere.
JDG 7:18 Mgbe ọbụla mụ na ndị so m nʼazụ fụrụ opi ike anyị, unu niile ga-afụkwa opi ike unu nʼakụkụ ọbụla unu nọ, tie mkpu, sị, ‘Anyị dịnyere Onyenwe anyị, dịnyekwara Gidiọn.’ ”
JDG 7:19 Nʼabalị ahụ, mgbe etiti abalị ahụ gabigasịrị, Gidiọn na narị ndị agha ya gbeere egbere ruo na mpụta ebe ndị agha Midia mara ụlọ ikwu ha. Nʼoge a, ha ka gbanwere ndị agha na-eche nche.
JDG 7:20 Ụzọ ndị agha Gidiọn atọ ahụ fụrụ opi ike ha, tiwakwaa ite aja ha. Ha ji ọwaọkụ ndị ahụ nʼaka ekpe ha na opi ike ha gaje igbu nʼaka nri ha, ha tiri mkpu sị, “Mma agha Onyenwe anyị, na mma agha Gidiọn!”
JDG 7:21 Onye ọbụla nʼime ha guzoro nʼebe o kwesiri ịnọ gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ndị Midia niile malitere ịgba ọsọ, na-etikwa mkpu akwa mgbe ha na-agbalaga.
JDG 7:22 Mgbe ha fụrụ narị opi ike atọ ndị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ndị ikom niile nọ nʼakụkụ niile nke ọmụma ụlọ ikwu ahụ tụgharịa were mma agha gburịta onwe ha. Ndị agha ahụ gbapụrụ ọsọ gbara gaa Bet-Shita nʼụzọ Zerera, gbarukwaa nke oke ala Ebel-Mehola, nke dị nso Tabat.
JDG 7:23 A kpọpụtara ndị Izrel si Naftalị, na Asha na Manase niile ka ha pụta chụso ndị Midia ọsọ.
JDG 7:24 Gidiọn ziri ozi nʼala ugwu ugwu Ifrem sị ha, “Pụtanụ gbochie ụzọ niile ndị Midia si agbafe. Cheenụ ọnụ mmiri Jọdan niile nche ruo na Bet-Bara.” Ya mere, a kpọpụtara ndị ikom niile nọ na Ifrem, bụ ndị gbochiri mmiri Jọdan ruo na Bet-Bara.
JDG 7:25 Ha jidekwara ọchịagha ndị Midia abụọ, ndị aha ha bụ Oreb na Zeeb. Ha gburu Oreb nʼelu nkume nke na-aza aha ya ruo taa. E gbukwara Zeeb nʼebe a na-azọcha vaịnị. Ebe ahụ na-azakwa aha Zeeb ruo taa. Ha bipụrụ Oreb na Zeeb isi buru ha jekwuru Gidiọn nʼakụkụ osimiri Jọdan.
JDG 8:1 Ndị Ifrem jụrụ Gidiọn ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji meso anyị mmeso dị otu a? Ọ bụ gịnị mere i zighị ozi kpọ anyị mgbe ị gara ibuso ndị Midia agha?” Ha tara ya ụta nke ukwuu.
JDG 8:2 Ma Gidiọn zaghachiri ha sị, “Gịnị ka m rụpụtara e ji atụnyere nke unu. Ọ bụ na ntụtụkọta ihe ubi Ifrem adịghị mma karịa owuwe ihe ubi nke Abieza?
JDG 8:3 Chineke nyefere unu Oreb na Zeeb, ndị ndu Midia, nʼaka. Gịnị ka m rụpụtara a ga-eji tụnyere nke unu?” Okwu a mere ka ọnụma ha nʼebe ọ nọ dajụọ.
JDG 8:4 Nʼoge a, Gidiọn gabigara, gafee osimiri Jọdan, ya na narị ndị agha atọ so ya. Ike gwụrụ ha nke ukwuu ma ha nọgidere na-achụsi ndị iro ha ọsọ ike.
JDG 8:5 Ọ sịrị ndị ikom Sukọt, “Nyetụnụ ndị agha m achịcha nʼihi na ike gwụrụ ha. Ana m na-achụso Zeba na Zalmuna, ndị eze Midia ọsọ.”
JDG 8:6 Ma ndịisi Sukọt sịrị, “Anyị ga-esi aṅaa nye ndị agha gị achịcha? Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị?”
JDG 8:7 Mgbe ahụ, Gidiọn zaghachiri, “Nʼihi nke a, mgbe Onyenwe anyị nyefere m Zeba na Zalmuna nʼaka, aga m eji ogwu na ụga na-epu nʼọzara dọkasịa unu ahụ.”
JDG 8:8 O sitere nʼebe ahụ gaa Peniel rịọkwaa ndị obodo ahụ otu arịrịọ ahụ. Ma otu ụdị ọsịsa ahụ ndị Sukọt nyere ka ndị Peniel nyekwara.
JDG 8:9 Ya mere, ọ gwara ndị ikom Peniel sị, “Mgbe m nwere mmeri lọta, aga m akwatu ụlọ elu a.”
JDG 8:10 Nʼoge a, Zeba na Zalmuna na puku ndị agha iri na ise fọdụụrụ ha nọ na Kako. Ndị a bụ naanị ndị agha fọdụrụ nʼime usuu ndị agha ndị Midia niile. Nʼihi na ọnụọgụgụ ndị agha e gburu egbu dị narị puku na iri puku abụọ.
JDG 8:11 Gidiọn rigoro site ụzọ ndị na-achị anụ ụlọ nke dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Nọba na Jogbeha, bịakwasị ndị agha ahụ na mberede nʼihi na ha nọ nʼatụghị egwu ihe ọbụla ime ha.
JDG 8:12 Zeba na Zalmuna, eze abụọ ndị Midia, gbapụrụ ọsọ, ma Gidiọn na ndị agha ya chụgidere ha ọsọ, jide ha. Ha gweriri ndị agha ha niile.
JDG 8:13 Emesịa, Gidiọn nwa Joash, sitere nʼokporoụzọ Heres lọta agha ahụ.
JDG 8:14 Nʼebe ahụ ka Gidiọn nọ jide otu nwokorobịa onye Sukọt. O jụrụ ya ajụjụ, nwokorobịa ahụ depụtakwaara ya aha ndịisi obodo Sukọt. Ha dị iri asaa na asaa, ndị okenye obodo ahụ.
JDG 8:15 Mgbe Gidiọn bịaruru obodo Sukọt, ọ gwara ha okwu sị, “Ngwa leenụ Zeba na Zalmuna ndị unu kparịrị m maka ha, kwuo sị, ‘Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị ugbu a nke mere na anyị ga-enye ndị ikom gị ike gwụrụ achịcha?’ ”
JDG 8:16 O jidere ndị okenye obodo ahụ, were ogwu na ụga taa ndị ikom Sukọt ahụhụ ime ka ha mara ihe.
JDG 8:17 Ọ kwaturu ụlọ elu Peniel gbukwaa ndị ikom obodo ahụ niile.
JDG 8:18 Mgbe ahụ, ọ jụrụ Zeba na Zalmuna, “Ndị ikom dị aṅaa ka unu gburu na Taboa?” Ha zara sị ya, “Ha nwere ụdịdị ka gị onwe gị, onye ọbụla nwere ụdịdị dịka nwa eze.”
JDG 8:19 Gidiọn zaghachiri sị, “Ndị ahụ bụ ụmụnne m ndị ikom, ndị nke nne m mụrụ. Ugbu a, Onyenwe anyị nʼonwe ya maara na a sị na unu egbughị ha, agaraghị m egbu unu.”
JDG 8:20 O chigharịrị gwa Jeta, ọkpara ya, sị ya, “Gbuo ha!” Ma Jeta amịpụtaghị mma, nʼihi na ọ bụ naanị nwokorobịa. Ọ tụrụ egwu igbu ha.
JDG 8:21 Zeba na Zalmuna, gwara Gidiọn okwu sị, “Jiri aka gị gbuo anyị. ‘A hụ dimkpa, a hụ ike ya.’ ” Nʼihi nke a, Gidiọn were aka ya gbuo ha, chịkọrọkwa ihe olu niile ha nyakwasịrị ịnyịnya kamel ha nʼolu.
JDG 8:22 Mgbe ahụ, ndị Izrel gwara Gidiọn sị ya, “Bịa ka ị bụrụ eze anyị! Gị na ụmụ gị ndị ikom, na ezinaụlọ gị niile, ga-abụ ndị ga-achị, nʼihi na ị gbapụtala anyị site nʼaka usuu ndị agha Midia.”
JDG 8:23 Ma Gidiọn gwara ha okwu sị, “Mụ onwe m na ụmụ m agaghị abụ eze unu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ eze unu.”
JDG 8:24 Ọ sịrị, “Enwere m otu arịrịọ m ga-arịọ unu. Onye ọbụla nʼime unu nye m ọlantị site nʼoke unu nwetara site nʼihe nkwata nʼagha.” (Ọ bụ omenaala ndị Ishmel niile iyi ọlantị ọlaedo.)
JDG 8:25 Ha jiri obi ụtọ kwenye, gbasaa akwa nʼala, tinyechaa ọlantị ha nʼime ya. Onye ọbụla nʼime ha mere nke a.
JDG 8:26 Ịdị arọ nke ọlantị ọlaedo ndị a bụ otu puku na narị shekel asaa, na-agụnyeghị ihe ịchọ mma ndị ọzọ, na ihe olu, na uwe odo odo ndị eze Midia na-eyi, na ihe olu dị nʼolu ịnyịnya kamel ha.
JDG 8:27 Gidiọn jiri ọlaedo ahụ niile kpụọ efọọd debe ya nʼOfra, nʼobodo nke aka ya. Ma mgbe na-adịghị anya, ụmụ Izrel niile malitere ịgbaso na ife ihe ahụ ofufe. Nʼụzọ dị otu a, ọ ghọọrọ Gidiọn na ezinaụlọ ya ihe ịma nʼọnya.
JDG 8:28 Otu a ka Midia si ghọọ ndị Izrel meriri emeri. Midia eweliteghị isi ya ọzọ. Nʼihi nke a, Izrel biri nʼudo iri afọ anọ, nʼụbọchị niile Gidiọn dị ndụ.
JDG 8:29 Jerub-Baal, nwa Joash laghachiri nʼụlọ nke aka ya, biri nʼebe ahụ.
JDG 8:30 Ọ mụtakwara iri ụmụ ndị ikom asaa, nʼihi na ọ lụrụ ọtụtụ ndị inyom.
JDG 8:31 O nwekwara iko nwanyị nʼobodo Shekem, onye mụtaara ya nwa nwoke aha ya bụ Abimelek.
JDG 8:32 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Gidiọn nwa Joash, nwụrụ, mgbe ọ kasịrị nka nke ukwu. E liri ya nʼili nna ya Joash nʼobodo Ofra, nʼala Abieza.
JDG 8:33 Ọ dịghị anya ka Gidiọn nwụsịrị, ụmụ Izrel laghachiri azụ bido ife chi Baal. Ha guzobere Baal-Berit ka ọ bụrụ chi ha.
JDG 8:34 Ma ụmụ Izrel echetaghị Onyenwe anyị Chineke ha, onye napụtara ha site nʼaka ndị iro ha niile gbara ha gburugburu.
JDG 8:35 Ha ekwesighịkwa ntụkwasị obi nye ezinaụlọ Jerub-Baal (ya bụ Gidiọn) dịka ezi ihe niile o mere ha si dị.
JDG 9:1 Otu ụbọchị, Abimelek nwa Jerub-Baal jekwuuru ụmụnne nne ya ndị ikom bi na Shekem, na ndị ikwu nne ya niile sị ha,
JDG 9:2 “Jekwurunụ ndị Shekem jụọ ha, ‘Kedụ nke kara unu mma: ọ bụ ka ụmụ iri ndị ikom asaa Jerub-Baal mụrụ chịa unu, ka ọ bụ ka otu onye chịa unu?’ Chetakwanụ na mụ na unu bụ otu anụ ahụ na ọbara.”
JDG 9:3 Mgbe ụmụnne nne ya ndị ikom gwara ndị Shekem ihe Abimelek kwuru, ha kwekọrịtara iso ya nʼihi na ha kwuru sị, “Nwanne anyị ka ọ bụ.”
JDG 9:4 Ha sitere nʼụlọ arụsị Baal-Berit nye ya iri shekel ọlaedo asaa. Abimelek ji ego ndị a goo ndị efulefu jọgburu onwe ha, ndị na-akpọghị ndụ ha ihe ọbụla, ndị kwenyere ma gbasoro ya.
JDG 9:5 Ọ gara nʼụlọ nna ya nʼobodo Ofra. Nʼebe ahụ, o gburu iri ndị ikom asaa ahụ bụ ụmụnna ya nʼelu otu nkume. Kama Jotam, bụ ọdụdụ nwa Jerub-Baal, zoro onwe ya gbapụ.
JDG 9:6 Mgbe ahụ, ndị Shekem na ndị Bet Milo kpọrọ nzukọ nʼokpuru osisi ukwu dị nʼobodo ahụ nʼakụkụ ogidi e guzobere ọtọ na Shekem. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee Abimelek eze Izrel.
JDG 9:7 Mgbe Jotam nụrụ ya, o rigooro nʼugwu Gerizim guzo nʼebe ahụ tikuo ndị Shekem niile mkpu si ha, “Geenụ m ntị ka Chineke nwe ike gee unu ntị.
JDG 9:8 Otu mgbe, osisi niile pụrụ ije ịga tee otu onye mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị ha. Ha sịrị osisi oliv, ‘Bụrụ eze anyị.’
JDG 9:9 “Ma osisi oliv jụrụ ha ajụjụ sị, ‘O kwesiri ka m hapụ iwepụta mmanụ m a nke a na-esite na ya sọpụrụ Chineke na ụmụ mmadụ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’
JDG 9:10 “Ọzọkwa, ha rịọrọ osisi fiig ka ọ bụrụ eze ha.
JDG 9:11 “Ma osisi fiig sịrị, ‘Ọ bụrụ na m ekwere na m ga-abụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi na-atọ ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’
JDG 9:12 “Ọzọkwa, ha rịọrọ osisi vaịnị ma ọ ga-ekwenye ịbụ eze ha.
JDG 9:13 “Ma osisi vaịnị ahụ zara sị ha, ‘Ọ bụrụ na m ekwere ịbụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi e ji eme mmanya nke na-enye Chineke na ụmụ mmadụ obi ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’
JDG 9:14 “Nʼikpeazụ, osisi niile jekwuuru ogwu ọhịa, ‘Bịa ka ị bụrụ eze anyị.’
JDG 9:15 “Ogwu ọhịa sịrị osisi niile, ‘Ọ bụrụ nʼezie na unu chọrọ ite m mmanụ ka m bụrụ eze unu, bịanụ zere ndụ nʼokpuru ndo m kpọkwanụ isiala nye m. Ọ bụrụ na unu ajụ ime nke a, ka ọkụ si nʼogwu ọhịa pụta rechapụ sida niile dị na Lebanọn!’
JDG 9:16 “Ugbu a, omume unu o ziri ezi ma sitekwa nʼezi obi na unu mere Abimelek eze? Mmeso unu mesoro Jerub-Baal na ezinaụlọ ya o ziri ezi? Unu omesoro ya dịka o kwesiri ya?
JDG 9:17 Chetakwanụ na nna m lụrụ ọgụ maka unu, kpọọ ndụ ya ihe efu, nʼihi ịnapụta unu site nʼaka ndị Midia.
JDG 9:18 Ma taa, unu enupula isi megide nna m na ezinaụlọ ya, gbuo iri ụmụ ndị ikom asaa ya nʼelu otu nkume, meekwa Abimelek nwa ya nwoke nke ohu nwanyị ya mụtara eze ga-achị ndị Shekem niile, nʼihi na ọ bụ onye nke unu.
JDG 9:19 Nke a o gosiri na omume unu ziri ezi, sitekwa nʼobi ọcha nʼebe Jerub-Baal na ezinaụlọ ya nọ taa? Ọ bụrụ na unu mere otu a, ka Abimelek bụrụ onye ga-ewetara unu ọṅụ ka unu bụkwara ndị ga-ewetara ya ọṅụ.
JDG 9:20 Ma ọ bụrụ na omume unu ezighị ezi, ka ọkụ si nʼAbimelek pụta repịa unu, ndị Shekem na Bet Milo, ka ọkụ sitekwa nʼebe unu bụ ndị Shekem na Bet Milo, pụta repịa Abimelek.”
JDG 9:21 Emesịa, Jotam gbapụrụ, gbaga Bịa, biri nʼebe ahụ nʼihi egwu Abimelek bụ nwanna ya.
JDG 9:22 Mgbe ọ gasịrị afọ atọ Abimelek bidoro ịchị Izrel,
JDG 9:23 Chineke kpaliri iro dị ukwuu nʼetiti Abimelek na ndị nwe obodo Shekem, nke bụ na ha mere omume ihu abụọ megide Abimelek.
JDG 9:24 Chineke mere nke a nʼihi na ọ chọrọ ịbọta ọbọ ọbara iri ụmụ Jerub-Baal asaa ahụ nʼisi Abimelek, na ndị Shekem ahụ bụ ndị nyeere ya aka gbuo ụmụnne ya.
JDG 9:25 Nʼọnọdụ imegide ya, ndị Shekem doro ndị ikom ụfọdụ nʼelu ugwu niile, ndị zoro nʼebe ahụ na-apụnara ndị ọbụla na-esite nʼebe ahụ agafe ihe ha nwere. E mere ka Abimelek mata na ihe dị otu a na-eme.
JDG 9:26 Nʼoge ahụ, Gaal, nwa Ebed, chịkọtara ụmụnne ya ndị ikom gaa biri na Shekem, ndị Shekem nwere ntụkwasị obi nʼebe ọ nọ.
JDG 9:27 Mgbe ha pụrụ baa nʼubi, chịkọta mkpụrụ vaịnị, zọchaa ha, ha mere mmemme nʼụlọ chi ha. Mgbe ha nọ na-eri na-aṅụ, ha kọchara Abimelek.
JDG 9:28 Mgbe ahụ, Gaal nwa Ebed sịrị, “Onye bụ Abimelek? Gịnị mere na anyị bụ ndị Shekem ga-eji nọrọ nʼokpuru ya? Ọ bụghị nwa Jerub-Baal? Ọ bụkwaghị Zebul bụ onye na-esote ya? Ọ bụ ka anyị fee ezinaụlọ Hamọ, nna Shekem ofufe. Ọ bụ maka gịnị ka anyị ga-eji fee Abimelek ofufe?
JDG 9:29 A sịkwarị na ndị a nọ nʼokpuru ọchịchị m, mgbe ahụ, m ga-ewezuga Abimelek. Aga m asị ya, ‘Kpọpụta ndị agha gị niile.’ ”
JDG 9:30 Mgbe Zebul onye na-achị obodo ahụ nụrụ ihe Gaal nwa Ebed kwuru, o were nnọọ oke iwe.
JDG 9:31 O zigara Abimelek ndị ozi na nzuzo ka ha sị ya, “Gaal nwa Ebed na ndị ikwu ya abịala obodo Shekem. Ha akpaliela obi ndị obodo a niile ka ha megide gị.
JDG 9:32 Ugbu a, gị na ndị agha gị, bịanụ nʼabalị zoo onwe unu nʼọhịa.
JDG 9:33 Nʼụtụtụ, mgbe anwụ wara, busonụ obodo a agha. Mgbe Gaal na ndị ya pụtara ịlụso gị agha, mee ha ihe dị gị mma.”
JDG 9:34 Ya mere, Abimelek na ndị agha ya dị nʼotu anọ, jiri abalị bilie jeruo Shekem zoo onwe ha na nso obodo ahụ.
JDG 9:35 Gaal nwa Ebed pụrụ guzo nʼọnụ ama obodo ahụ mgbe Abimelek na ndị ya sitere nʼebe ha zoro onwe ha pụta.
JDG 9:36 Mgbe Gaal hụrụ ha, ọ kpọrọ Zebul si ya, “Lee ndị mmadụ sị nʼelu ugwu ndị a na-arịdata.” Zebul zara si ya, “Ọ bụghị mmadụ ka ị na-ahụ, kama ọ bụ onyinyo ugwu ka ị na-akpọ mmadụ.”
JDG 9:37 Gaal kwukwara okwu sị, “Lee ndị mmadụ si nʼetiti ala ahụ na-arịdata, ndị ọzọ sikwa nʼakụkụ ụzọ ebe osisi iju ase dị.”
JDG 9:38 Mgbe ahụ, Zebul sịrị ya, “Olee uru ọ bara na ị turu ọnụ, gị onye na-asị, ‘Onye bụ Abimelek na anyị ga-efe ya ofufe?’ Ọ bụ ndị a abụghị ndị ahụ ị kọchara? Pụkwuru ha gaa lụso ha ọgụ.”
JDG 9:39 Ya mere, Gaal duuru ndị nwe Shekem pụọ ịlụso Abimelek ọgụ.
JDG 9:40 Ma Abimelek chụụrụ ya ọsọ ruo mbata ọnụ ụzọ ama, ọtụtụ bụkwa ndị egburu ka ha na-agba ọsọ.
JDG 9:41 Abimelek nọgidere nʼAruma nʼoge ahụ. Ma Zebul chụpụrụ Gaal na ndị ikwu ya site na Shekem.
JDG 9:42 Nʼechi ya, ndị Shekem pụtara baa nʼọhịa. E mere ka Abimelek mara nke a.
JDG 9:43 Nʼihi ya, Abimelek kere ndị agha ya ụzọ atọ. Ha niile zokwara onwe ha nʼọhịa. Mgbe ọ hụrụ ka ndị mmadụ si nʼime obodo ahụ na-apụta, o biliri buso ha agha.
JDG 9:44 Abimelek na usuu ndị agha so ya mapụtara, gbara ọsọ were ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Emesịa, ụzọ abụọ nʼime ụzọ atọ nke ndị agha na-eso ya chere ihu nʼọhịa gbuo ndị ahụ niile nọ nʼebe ahụ.
JDG 9:45 Ụbọchị ahụ niile, Abimelek busoro obodo ahụ agha tutu ruo mgbe o meriri ya, gbuo ndị niile bi nʼime ya. Emesịa, ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, fesaa nnu nʼala ya niile.
JDG 9:46 Mgbe ndị nwe ala nọ nʼụlọ elu Shekem nụrụ ihe mere, ha gbabanyere nʼebe e wusiri ike nke ụlọ arụsị El Berit.
JDG 9:47 Mgbe Abimelek nụrụ na ha ezukọtala nʼebe ahụ,
JDG 9:48 ya na ndị agha ya rigoro ugwu Zalmon. O ji anyụike gbutuo ụfọdụ ngalaba osisi nke ọ tụkwasịrị nʼubu ya. O nyere ndị agha ya iwu si, “Ngwa, meenụ ihe unu hụrụ na m mere.”
JDG 9:49 Ya mere, ndị agha ya niile gbuturu alaka osisi buru ha soro Abimelek. Ha tụkọtara alaka osisi ndị a niile nʼakụkụ ebe ahụ e wusiri ike mụnye ha ọkụ ka o regbuo ndị mmadụ nọ nʼime ya. Ya mere, ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ elu Shekem, nwoke na nwanyị, ndị ọnụọgụgụ ha ruru otu puku nwụrụ.
JDG 9:50 Ọzọ, Abimelek gara obodo Tebez lụso ya agha, merie ya.
JDG 9:51 Ma e nwere nʼime obodo ahụ, otu ụlọ elu e wusiri ike, ebe ndị obodo ahụ niile, nwoke na nwanyị, gbabanyere. Ha kpọchidoro onwe ha ụzọ, rigoro nʼelu ụlọ ahụ.
JDG 9:52 Abimelek gara nʼụlọ elu ahụ ibuso ya agha. Ma mgbe ọ na-abịaru ọnụ ụzọ ama ụlọ elu ahụ isunye ya ọkụ,
JDG 9:53 otu nwanyị tụdara nkume igwe nri nʼisi ya, nke tiwara okpokoro isi ya.
JDG 9:54 Ngwangwa, Abimelek kpọrọ onye na-ebu ihe agha ya sị ya, “Sepụta mma agha gị jiri ya gbuo m, ka ndị mmadụ ghara ị sị banyere m, ‘Ọ bụ nwanyị gburu ya.’ ” Ya mere nwokorobịa ahụ were mma agha ya dụgbuo ya, ọ nwụkwara.
JDG 9:55 Mgbe ndị Izrel hụrụ na Abimelek anwụọla, ha niile lara nʼụlọ ha.
JDG 9:56 Otu a ka Chineke si kwụghachi Abimelek ihe ọjọọ o mere megide nna ya site nʼigbu iri ụmụnna ya asaa.
JDG 9:57 Chineke mekwara ka ndị Shekem nata ụgwọ ọrụ ihe ọjọọ ha. Ọbụbụ ọnụ Jotam nwa Jerub-Baal mezukwara nʼisi ha.
JDG 10:1 Mgbe Abimelek nwụsịrị, Tola nwa Pua, nwa nwa Dodo, biliri ịzọpụta Izrel. O si nʼebo Isaka pụta. Ọ bụkwa nʼobodo Shamia ka o bi, nʼime obodo e wukwasịrị nʼelu ugwu Ifrem.
JDG 10:2 O kpere Izrel ikpe iri afọ abụọ na atọ. Mgbe ọ nwụrụ, e liri ya na Shamia.
JDG 10:3 Onye ikpe ọzọ nọchiri ya bụ Jaịa, onye si Gilead pụta. O kpere Izrel ikpe iri afọ abụọ na abụọ.
JDG 10:4 O nwere ụmụ ndị ikom iri atọ, ndị na-agba ịnyịnya ibu iri atọ. Ha nwekwara obodo iri atọ nke aka ha na Gilead, nke a na-akpọkwa Havọt Jaịa ruo taa.
JDG 10:5 Ma mgbe Jaịa nwụrụ, e liri ya na Kamon.
JDG 10:6 Ọzọkwa, ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼihu Onyenwe anyị, ha fere chi Baal na Ashtọret, chi ndị Aram, chi ndị Saịdọn, nke ndị Moab, nke ndị Amọn, na chi ndị Filistia ofufe. Ndị Izrel hapụrụ Onyenwe anyị, ha efekwaghị ya ofufe.
JDG 10:7 Nke a mere ka Onyenwe anyị wee iwe megide ha. O nyefere ha nʼaka ndị Filistia na ndị Amọn,
JDG 10:8 ndị mekpara ha ahụ, chie ha ọnụ nʼala. Afọ iri na asatọ ka ndị Filistia megburu ndị Izrel bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, nʼime ala ndị Amọrait, ya bụ na Gilead.
JDG 10:9 Ndị Amọn gafekwara osimiri Jọdan ibuso ndị Juda, ndị Benjamin na ndị Ifrem agha. Ihe ndị a mere ka ọnọdụ ụmụ Izrel dị nnọọ njọ nke ukwuu.
JDG 10:10 Nʼikpeazụ, ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, rịọọ ya ka ọ gbapụta ha. Ha kwupụtara sị, “Anyị emehiela megide gị, anyị ahapụla gị Chineke anyị, fee arụsị Baal ofufe.”
JDG 10:11 Ma Onyenwe anyị sịrị ndị Izrel, “Mgbe ndị Ijipt, ndị Amọrait, ndị Amọn, ndị Filistia,
JDG 10:12 ndị Saịdọn, ndị Amalek na ndị Maon kpagburu unu; unu tikuru m mkpu akwa inyere unu aka, ọ bụ na m anapụtaghị unu site nʼaka ha?
JDG 10:13 Ma unu nọgidere na-agbakụta m azụ oge niile, na-efe chi ndị ọzọ ofufe. Ya mere, gawaranụ onwe unu, agaghị m anapụtakwa unu ọzọ.
JDG 10:14 Kpọkuonụ chi ndị ahụ bụ ndị unu họpụtaara onwe unu, ka ha zọpụta unu mgbe ọbụla nsogbu dakwasịrị unu!”
JDG 10:15 Ma ndị Izrel sịrị Onyenwe anyị, “Anyị emehiela. Mee anyị ihe ọbụla i chere dị gị mma, ma biko, zọpụta anyị taa.”
JDG 10:16 Ha sitere nʼetiti ha wezuga chi ala ọzọ niile dị iche iche, fee Onyenwe anyị ofufe. O nweghịkwa ike nagide ọnọdụ ọjọọ ndị Izrel gaa nʼihu.
JDG 10:17 Mgbe a kpọkọtara ndị Amọn maka ibu agha, ha mara ụlọ ikwu ha na Gilead, ndị Izrel zukọtakwara maa ụlọ ikwu nke ha na Mizpa.
JDG 10:18 Ndị ndu obodo Gilead gwarịtara onwe ha sị, “Onye ọbụla ga-amalite agha megide ndị Amọn ga-abụ onyeisi ndị niile bi na Gilead.”
JDG 11:1 Otu ọ dị, Jefta, onye Gilead, bụ dimkpa nʼagha. Nna ya bụ Gilead; nne ya bụ akwụna.
JDG 11:2 Nwunye Gilead mụtaara ya ọtụtụ ụmụ ndị ikom ọzọ. Mgbe ha tolitere, ha chụpụrụ Jefta site nʼobodo ahụ, sị ya, “Ị gaghị eketa ihe ọbụla nʼezi nna anyị, nʼihi na nwa nwanyị ọzọ ka ị bụ.”
JDG 11:3 Nʼihi nke a, Jefta gbapụrụ site nʼụlọ nna ya, gaa biri nʼobodo Tob. Mgbe na-adịghị anya, ọtụtụ ndị isi na-anụ ọkụ bịara nọnyere ya ma sorokwa ya.
JDG 11:4 O ruo mgbe ọtụtụ oge gasịrị, ndị Amọn busoro ụmụ Izrel agha.
JDG 11:5 Ndị okenye Gilead jere ịkpọpụta Jefta site nʼala Tob.
JDG 11:6 Ha sịrị ya, “Bịa buru onyeisi agha anyị ka anyị nwee ike ibuso ndị Amọn agha.”
JDG 11:7 Jefta sịrị ha, “Unu akpọghị m asị, ma chụpụkwa m site nʼụlọ nna m? Gịnị mere unu ji na-achọ m ugbu a unu nọ nʼoke nsogbu?”
JDG 11:8 Ndị okenye Gilead sịrị ya, “na-agbanyeghị nke a, anyị abịaghachikwutela gị ugbu a, bịa ka anyị na gị lụso ndị Amọn agha. Ị ga-abụkwa onyeisi anyị niile bi na Gilead.”
JDG 11:9 Jefta zara, “A sịkwarị na m esoro unu gaa lụso ndị Amọn agha, ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyefee ha nʼaka m, m ga-abụ onyeisi unu nʼezie?”
JDG 11:10 Ndị okenye Gilead zara, “Onyenwe anyị bụ onye akaebe, na anyị aghaghị ime dịka i kwuru.”
JDG 11:11 Ya mere, Jefta sooro ndị okenye Gilead, ha mekwara ya onyeisi ha na ọchịagha ha. O kwughachikwara okwu ya niile nʼihu Onyenwe anyị nʼobodo Mizpa.
JDG 11:12 Mgbe ahụ, Jefta zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe i nwere megide anyị i ji ebuso ala anyị agha?”
JDG 11:13 Eze ndị Amọn zaghachiri ndị ozi Jefta, “Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, ha ji aka ike napụ anyị ala anyị, site nʼosimiri Anọn ruo na Jabọk, rukwaa nʼosimiri Jọdan. Ugbu a nyeghachinụ anyị ala ahụ niile nʼudo.”
JDG 11:14 Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn,
JDG 11:15 na-asị, “Ihe ndị a ka Jefta sịrị: Izrel esiteghị nʼaka ike napụ Moab maọbụ Amọn ala ha.
JDG 11:16 Kama, mgbe ha si Ijipt rigopụta, Izrel sitere nʼọzara bịaruo Osimiri Uhie, sikwa nʼebe ahụ ruo Kadesh.
JDG 11:17 Mgbe ahụ, Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze Edọm sị ya, ‘Kwere ka anyị si nʼala gị gafere,’ ma eze Edọm jụrụ ajụ. Ha zipụkwara ozi nye eze Moab, ma o kwenyeghị. Nʼihi ya, Izrel nọgidere na Kadesh.
JDG 11:18 “Ọzọ, ha sitere nʼọzara gaa gburugburu Edọm na Moab, site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Moab, maa ụlọ ikwu ha nʼofe Anọn. Ha abaghị nʼoke ala Moab, nʼihi na Anọn bụ oke ala ya.
JDG 11:19 “Mgbe ahụ, ụmụ Izrel zigara ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn, sị ya, ‘Biko, ka anyị site nʼala gị gafee ruo nʼala nke anyị.’
JDG 11:20 Ma eze Saịhọn atụkwasịghị Izrel obi isite nʼoke ala ya gabiga. Nʼihi nke a, ọ chịkọtara usuu ndị agha ya, ma ụlọ ikwu na Jahaz, buso ụmụ Izrel agha.
JDG 11:21 “Mgbe ahụ, Onyenwe anyị, Chineke Izrel nyere Saịhọn na ndị agha ya niile nʼaka Izrel. Ha merikwara ha. Izrel nwetara ala niile nke ndị Amọrait, bụ ndị bi nʼala ahụ.
JDG 11:22 Ha nwetara ala niile ahụ, site nʼAnọn ruo Jabọk, sitekwa nʼọzara ruo Jọdan.
JDG 11:23 “Ma ugbu a, Onyenwe anyị, Chineke Izrel achụpụla ndị Amọrait nʼihu ndị ya bụ Izrel. Olee ikike i nwere iwere ala ahụ?
JDG 11:24 Ọ bụghị ihe chi gị, Kemosh, nyere gị ka i ga-enweta? Otu aka ahụ kwa, ihe ọbụla Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị ka anyị ga-enweta.
JDG 11:25 Ị dị mma karịa Balak nwa Zipoa, eze Moab? O nwere mgbe ọ chọrọ Izrel okwu, maọbụ lụso ha agha?
JDG 11:26 Ọ bụ narị afọ atọ kemgbe ụmụ Izrel malitere ibi na Heshbọn na Aroea, na nʼime obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu ruo nʼiyi Anọn. Ọ bụkwa gịnị mere na ịnapụtaghị ala ndị a nʼoge ndị ahụ?
JDG 11:27 Emegideghị m gị, kama ọ bụ gị na-emejọ m, site nʼibuso m agha. Ka Onyenwe anyị, onye na-ekpe ikpe ziri ezi kpebie ikpe a taa nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọn.”
JDG 11:28 Ma eze Amọn egeghị ntị nʼozi Jefta ziri ka e zie ya.
JDG 11:29 Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị dakwasịrị Jefta. Site nʼike mmụọ ahụ, o duuru ndị agha Izrel gafee obodo Gilead na Manase, gafeekwa Mizpa, nke dị nʼime Gilead, gaa lụso ndị Amọn agha.
JDG 11:30 Jefta kwere Onyenwe anyị nkwa sị ya, “Ọ bụrụ na ị ga-enyefe ndị Amọn nʼaka m,
JDG 11:31 ihe ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m lọghachiri nʼọnọdụ mmeri megide ndị Amọn, ga-abụ nke Onyenwe anyị. Aga m eji ya chụọ aja nsure ọkụ.”
JDG 11:32 Jefta duuru ndị agha ya gaa ibuso Amọn agha. Onyenwe anyị nyekwara ya mmeri dị ukwuu.
JDG 11:33 O bibiri iri obodo abụọ site nʼAroea ruo nso nso Minit, ruokwa Ebel-Keramim. Otu a ka Izrel si merie ndị Amọn.
JDG 11:34 Mgbe Jefta lọghachiri nʼụlọ ya na Mizpa, ma lee ada ya nwanyị onye ji iti egwu na ite egwu pụta izute ya. Ọ bụ naanị ya ka nna ya mụtara. Ewezuga ya, nna ya amụtaghị nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị ọzọ.
JDG 11:35 Mgbe Jefta hụrụ ya, ọ dọwara uwe ya, tie mkpu sị, “Ewoo, nwa m nwanyị! I wetarala obi m ihe mgbu, nʼihi na ekwela m Onyenwe anyị nkwa, nke m na-aghaghị imezu.”
JDG 11:36 Ọ zara, “Nna m, lee, ị ghaghị imezu ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa. Jiri m mee ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa, nʼihi na o nyela gị mmeri dị ukwuu nʼebe ndị Amọn, ndị iro gị nọ.
JDG 11:37 Ma ọ dị otu ihe m chọrọ ịrịọ gị, biko kwere ka m soro ụmụ agbọghọ ibe m gaa wagharịa nʼugwu ndị a, ka mụ na ha kwaa akwa ọnwa abụọ, nʼihi na agaghị m alụ di.”
JDG 11:38 Nna ya zara sị ya, “E, nwa m, i nwere ike ịga.” Ọ pụrụ gaa, jegharịa, kwaakwa akwa, ya na ụmụ agbọghọ ndị enyi ya, ruo mgbe ọnwa abụọ ahụ zuru.
JDG 11:39 Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, ọ laghachikwutere nna ya, onye ji ya mezuo nkwa ahụ o kwere. Ọ bụ nwaagbọghọ na-amatabeghị nwoke. Malite nʼoge ahụ ka ọ ghọrọ omenaala ndị Izrel,
JDG 11:40 na ụmụ agbọghọ na-apụ kwa afọ, gaa, nọọ abalị anọ nʼihi icheta ada Jefta, onye Gilead.
JDG 12:1 Mgbe ahụ, ndị Ifrem kpọkọtara ndị agha ha na Zafọn zigara Jefta ozi sị ya, “Gịnị mere ị kpọghị anyị ka anyị bịa nyere gị aka ịlụso ndị Amọn agha? Anyị na-abịa iwere ọkụ irechapụ gị na ezinaụlọ gị.”
JDG 12:2 Jefta zaghachiri ha sị, “Akpọrọ m unu mgbe mụ na ndị m na ndị Amọn na-ese okwu dị ukwu ma unu jụrụ ịbịa. Unu azọpụtaghị m site nʼaka ha.
JDG 12:3 Mgbe m hụrụ na unu achọghị inyere anyị aka, e tinyere m ndụ m nʼaka m, gabiga nʼofe nke ọzọ ibuso ndị Amọn agha. Ma Onyenwe anyị nyeere m aka imeri ha. Ugbu a, nʼihi gịnị ka unu ji bịa ịlụso m ọgụ taa?”
JDG 12:4 Jefta kpọkọtara ndị ikom Gilead pụọ buso ndị Ifrem agha. Ndị Gilead tidara ha nʼala nʼihi na ndị Ifrem sịrị, “Ndị gbapụrụ agbapụ site nʼIfrem na Manase ka unu bụ.”
JDG 12:5 Ọ nọchiri akụkụ Jọdan dị ndị agha Ifrem nʼazụ, ebe ndị agha Ifrem nwere ike isi gbapụ. Mgbe ọbụla onye agha Ifrem ọbụla gbapụrụ ọsọ chọọ ịgafe osimiri ahụ, ndị agha Gilead ga-ejide ya jụọ ya sị, “Ị bụ onye Ifrem?” Ọ bụrụ na onye ahụ ekwuo na ya abụghị onye Ifrem,
JDG 12:6 ha sịrị, “Ọ dị mma, kpọọ, ‘Shibolet.’ ” Ọ bụrụ na onye ahụ akpọ, “Sibolet,” nʼihi na ọ kpọpụtaghị mkpụrụ okwu ahụ nke ọma, ha na-akpụrụ ya gbuo ya na ngabiga mmiri Jọdan. Ọ bụ ọnụọgụgụ iri puku anọ, na puku abụọ ndị Ifrem ka e gburu mgbe ahụ.
JDG 12:7 Jefta duuru ndị Izrel afọ isii. Mgbe ọ nwụrụ, e liri ya nʼotu obodo Gilead.
JDG 12:8 Onye ikpe ọzọ Izrel nwere bụ Ibzan onye bi na Betlehem.
JDG 12:9 O nwere iri ụmụ ndị ikom atọ na iri ụmụ ndị inyom atọ. O kenyere ndị ikom ikwu ọzọ ụmụ ya ndị inyom. Otu a kwa, o sikwa nʼikwu ọzọ lụtara ụmụ ya ndị ikom iri ndị inyom atọ. O kpere Izrel ikpe afọ asaa.
JDG 12:10 Ibzan nwụrụ, e lie ya na Betlehem.
JDG 12:11 Onye ọzọ kpere Izrel ikpe bụ Elọn, onye Zebụlọn. O kpere Izrel ikpe afọ iri.
JDG 12:12 Emesịa, Elọn nwụrụ, e lie ya nʼAijalon, nʼime ala Zebụlọn.
JDG 12:13 Onye ọzọ kpere Izrel ikpe bụ Abdon nwa Hilel, onye Piraton.
JDG 12:14 O nwere iri ụmụ ndị ikom anọ na iri ụmụ ụmụ atọ ndị na-agba iri ịnyịnya ibu asaa. O kpere ụmụ Izrel ikpe afọ asatọ.
JDG 12:15 Mgbe ahụ, Abdon nwa Hilel nwụrụ, e lie ya na Piraton ala dị nʼIfrem, nʼobodo ugwu ndị Amalek.
JDG 13:1 Ndị Izrel mehiekwara ọzọ nʼihu onyenwe anyị. Nʼihi nke a, Onyenwe anyị kwenyere ka ndị Filistia merie ha. Ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ha iri afọ anọ.
JDG 13:2 Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa.
JDG 13:3 Otu ụbọchị, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa.
JDG 13:4 Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ.
JDG 13:5 Ị ga-atụrụ ime, mụkwaa nwa nwoke, onye agụba agaghị aba nʼisi ya, nʼihi na ọ ga-abụ onye e kewapụrụ nye Chineke site nʼime akpanwa. Ọ ga-ebute ụzọ nʼịgbapụta Izrel site nʼaka ndị Filistia.”
JDG 13:6 Nwanyị ahụ gbara ọsọ gbalaa gaa gwa di ya sị ya, “Otu onye nke Chineke egosila m onwe ya. O dokwara m anya na ọ bụ mmụọ ozi Chineke, nʼihi na ọ dị oke ebube nʼile anya. Ma ajụghị m ya ebe o siri bịa, ọ gwakwaghị m aha ya.
JDG 13:7 Kama ọ sịrị m, ‘Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke. Ma ugbu a, ị gaghị aṅụ mmanya vaịnị maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe ọbụla rụrụ arụ, nʼihi na nwantakịrị ahụ ga-abụ onye e doro nsọ nye Chineke, site nʼime akpanwa ruo nʼọnwụ ya.’ ”
JDG 13:8 Mgbe ahụ, Manoa kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “Biko, Onyenwe anyị, ka onye nke Chineke ahụ i ziteere anyị bịaghachikwa ọzọ, kuziere anyị otu anyị ga-esi zụlite nwa nwoke a ga-amụta.”
JDG 13:9 Chineke zara ekpere ya. Mmụọ ozi ahụ bịakwutekwara nwunye Manoa mgbe ọ nọ nʼubi; maọbụ naanị ya nọ, di ya anọghị ya.
JDG 13:10 Ya mere, nwanyị ahụ gbara ọsọ gaa gwa di ya sị, “Lee, nwoke ahụ bịakwutere m ụbọchị a, abịala ọzọ!”
JDG 13:11 Manoa biliri, soro nwunye ya. Mgbe o bịarutere ebe nwoke ahụ nọ, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ gwara nwunye m okwu nʼoge gara aga?” Ọ zara sị ya, “E, ọ bụ m.”
JDG 13:12 Manoa gwara ya okwu sị, “Mgbe okwu gị mezuru, gịnị bụ iwu banyere ndụ na ọrụ nwa nwoke a?”
JDG 13:13 Mmụọ ozi Onyenwe anyị zaghachiri, “Nwunye gị aghaghị imezu ihe niile m nke m gwara ya.
JDG 13:14 Ka ọ ghara iri ihe ọbụla si nʼosisi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmanya ọbụla maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe rụrụ arụ ọbụla.”
JDG 13:15 Manoa rịọrọ Mmụọ ozi Onyenwe anyị si ya, “Ọ ga-amasị anyị ma ị nọdụ chere ka anyị kwadoro gị nwa ewu.”
JDG 13:16 Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị zara ya, “A sịkwarị na i mee ka m nọrọ, agaghị m eri nri gị ọbụla. Ma ọ bụrụ na i kwadoo aja nsure ọkụ, were ya chụọrọ Onyenwe anyị aja.” Ma Manoa aghọtaghị na onye ahụ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị.
JDG 13:17 Mgbe ahụ, Manoa jụrụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ, sị, “Biko, gịnị bụ aha gị, ka anyị nye gị nsọpụrụ dịịrị gị mgbe okwu gị mezuru?”
JDG 13:18 Ọ zara, “Nʼihi gịnị kwa ka ị na-ajụ banyere aha m? Ọ bụ ihe karịrị nghọta.”
JDG 13:19 Mgbe ahụ, Manoa weere nwa ewu, ya na ụfọdụ mkpụrụ ọka, jiri ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼelu nkume. Mgbe ahụ kwa, Onyenwe anyị mere ihe dị ebube nke ukwuu mgbe Manoa na nwunye ya guzo na-ele anya:
JDG 13:20 Mgbe ire ọkụ ahụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ na-arịgo na-aga elu, Mmụọ ozi Onyenwe anyị wụliri elu soro ire ọkụ ahụ rigoro gawa nʼeluigwe! Mgbe Manoa na nwunye ya hụrụ ka nke a na-eme, ha kpuru ihu ha nʼala.
JDG 13:21 Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-egosighị onwe ya ọzọ nye Manoa na nwunye ya, ka Manoa ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ka ha hụrụ.
JDG 13:22 Manoa gwara nwunye ya sị, “Anyị abụrụla ndị nwụrụ anwụ, nʼihi na anyị ahụla Chineke!”
JDG 13:23 Ma nwunye ya zara sị ya, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị chọrọ igbu anyị, ọ garaghị anara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka anyị chụrụ nye ya. Ọzọkwa, ọ garaghị egosi anyị ihe ndị a niile maọbụ gwa anyị ihe ndị a.”
JDG 13:24 Emesịa, nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke, onye ha gụrụ Samsin. Onyenwe anyị gọzikwara nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-etolite.
JDG 13:25 Mmụọ Onyenwe anyị bidokwara na-agba ya ume nʼoge niile, mgbe ọ nọ Mahane Dan, nke dị nʼetiti Zora na Eshtaol.
JDG 14:1 Samsin gbadara nʼobodo Timna ebe ọ hụrụ otu nwaagbọghọ onye Filistia.
JDG 14:2 Mgbe ọ lọtara nʼụlọ, ọ gwara nne na nna ya, “Ahụrụ m otu nwanyị nʼime Timna sitere nʼụmụ ndị inyom Filistia; ugbu a, lụtara m ya na nwunye.”
JDG 14:3 Nne na nna ya zara ya, “Ọ bụ na ọ dịghị nwanyị dị nʼetiti ndị inyom ụmụnne gị, maọbụ nʼetiti ndị anyị niile? Gịnị mere o ji bụrụ nʼetiti ndị Filistia a na-ebighị ugwu ka i si lụtara onwe gị nwunye?” Ma Samsin sịrị nna ya, “Gaa lụtara m ya. Nʼihi na o ziri ezi nʼanya m.”
JDG 14:4 (Nne na nna ya aghọtaghị na aka Onyenwe anyị dị nʼọlụlụ nwunye a Samsin chọrọ ịlụ. Nʼihi na Onyenwe anyị na-achọ ụzọ ọ ga-esi megide ndị Filistia, ndị na-achị ụmụ Izrel nʼoge ahụ.)
JDG 14:5 Samsin na nne na nna ya gawara obodo Timna maka ọlụlụ nwanyị a. Mgbe ha na-erute ubi vaịnị dị obodo Timna nso, otu nwa ọdụm sitere nʼọhịa mapụta, gbọrọ ụja na-abịakwute Samsin.
JDG 14:6 Nʼotu oge ahụ, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼike. O jekwuuru ọdụm ahụ, were aka ya abụọ dọwaa ya ọnụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwa ewu. Ma Samsin agwaghị nne na nna ya ihe mere.
JDG 14:7 Ma mgbe ha bịaruru Timna, Samsin na nwaagbọghọ ahụ kparịtara ụka. Ihe banyere nwaagbọghọ ahụ dị Samsin ezi mma.
JDG 14:8 Ọ laghachiri mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị ka ọ kpọrọ ya. Ma mgbe ọ tụgharịrị ka ọ hụ ozu ọdụm ahụ, ọ hụrụ na igwe aṅụ bizi nʼime ozu ọdụm ahụ, na-emepụtakwa mmanụ aṅụ.
JDG 14:9 Ọ kọpụtara mmanụ aṅụ ahụ tinye nʼaka ya, malite ịracha ka ọ na-aga nʼụzọ. Mgbe ọ bịakwutere nne na nna ya, o nyebinyere ha ụfọdụ, ha onwe ha rachakwara ya. Ma ọ gwaghị ha na o wetara ya site nʼozu ọdụm.
JDG 14:10 Nna ya gara ịhụ nwanyị ahụ ma Samsin kpọkọtara ụmụ okorobịa obodo ahụ meere ha oriri dịka omenaala ha sị di.
JDG 14:11 Mgbe Samsin rutere, a kpọnyere ya ndị bịara mmemme ọnụọgụgụ ha dị iri atọ.
JDG 14:12 Mgbe ahụ, Samsin gwara ha okwu sị ha, “O nwere ajụjụ, gwa m, gwa m, gwa m, m chọrọ ka unu kọwaara m. Ọ bụrụ na unu enwee ike kọwaa ya, site taa ruo nʼụbọchị asaa nke mmemme a, aga m enye unu iri uwe mwụda atọ, nyekwa unu iri uwe mwụda atọ ọzọ akpara akpa.
JDG 14:13 Ọ bụrụkwanụ na unu enweghị ike kọwaa ya, unu ga-enye m iri uwe mwụda atọ, na iri uwe mwụda atọ akpara akpa.” Ha niile kwenyere sị, “Ọ dị mma. Kwuo ka anyị nụ.”
JDG 14:14 Ọ gwara ha sị, “Ihe oriri si nʼime onye na-eri eri na-apụta, ọzọkwa, ihe dị ụtọ si nʼime onye dị ike pụta.” Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ha enwebeghịkwa ike kọwaa ya.
JDG 14:15 Ma nʼụbọchị nke anọ, ha jekwuuru nwunye Samsin gwa ya okwu sị, “Chọọ ụzọ rafụta di gị ọnụ, ka ọ gwa gị ihe okwu a pụtara. Ma ọ bụghị ya, anyị ga-akpọ gị na ezinaụlọ nna gị ọkụ. Ọ bụ ịnapụ anyị ihe anyị nwere ka unu ji kpọọ anyị oku bịa nʼebe?”
JDG 14:16 Mgbe ahụ nwunye Samsin buuru onwe ya tụọ nʼelu ahụ ya, nʼebe akwa, sị, “Ị kpọrọ m asị! Nʼezie, ị hụghị m nʼanya. Ị tụụrụ ndị m ilu, ma ị gwaghị m ọsịsa ya.” Ọ sịrị ya, “Lee, agwaghị m nne na nna m, ọ bụkwa gị ka m ga akọwara ya?”
JDG 14:17 Ma nwanyị ahụ kwagidere akwa abalị asaa ha nọ na mmemme ahụ. Nʼikpeazụ, nʼụbọchị nke asaa, Samsin kọwaara ya okwu ahụ nʼihi na ọ nọgidere na-enye ya nsogbu. Nwanyị ahụ gakwara kọwaara ụmụ okorobịa obodo ihe okwu ahụ pụtara.
JDG 14:18 Ma tupu anwụ adaa nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị ikom obodo ahụ sịrị ya, “Olee ihe dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ? Gịnị dịkwa ike karịa ọdụm?” Ma Samsin zara sị ha, “A sị na unu enyeghị nwa ehi m nsogbu, unu agaraghị enwe ike kọwaa ya.”
JDG 14:19 Otu mgbe ahụ kwa, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya. O sitere nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼobodo Ashkelọn. Nʼebe ahụ ka ọ nọ tigbuo iri mmadụ atọ, napụ ha uwe ha niile, chịrị ha chịnye ndị ahụ kọwaara ya ilu ahụ. Ma site nʼoke iwe, o laghachiri nʼụlọ nna ya.
JDG 14:20 E duuru nwunye Samsin dunye enyi Samsin ka ha abụọ bụrụ di na nwunye.
JDG 15:1 Mgbe oge nta gasịrị, nʼoge owuwe ihe ubi, mgbe a na-aghọ ọka, Samsin weere nwa ewu nta, gaa ileta nwunye ya. O gwara nna nwunye ya sị, “Ana m aga nʼọnụụlọ nwunye m.” Ma nna nwunye ya ekweghị ka ọ banye.
JDG 15:2 Nna ya sịrị, “O doro m anya na ị kpọrọ nwa m nwanyị asị, ọ bụ nʼihi nke a ka m jiri kenye ya enyi gị nwoke ka ọ bụrụ nwunye ya. Nwanne ya nwanyị nke nta, ọ maghị mma karịa ya? Kpọrọ ya ka ọ nọchie anya ya.”
JDG 15:3 Samsin sịrị ha, “Nʼoge a, o ziri m ezi ị bọkwara ọbọ nʼebe ndị Filistia nọ.” Aghaghị m imesi ha ike.
JDG 15:4 Ya mere, Samsin pụrụ gaa jide narị nkịta ọhịa atọ, wetakwa ọwa ụfọdụ. O kekọtara ọdụdụ ha abụọ abụọ. O kenyere ọwa nʼagbata otu nkịta ọhịa na ibe ya.
JDG 15:5 Emesịa, ọ mụnyere ọkụ nʼọwa ahụ niile. O mekwara ka nkịta ọhịa ndị ahụ dọkpụrụ ọwa a mụnyere ọkụ baa nʼubi ọka ndị Filistia, si otu a rechapụ ọka niile guzoro eguzo nʼubi, na ubi vaịnị niile, ha na osisi oliv niile ọkụ.
JDG 15:6 Mgbe ndị Filistia chọpụtara ihe mere, ha jụrụ sị, “Onye mere ihe dị otu a?” A gwara ha, “Ọ bụ Samsin ọgọ onye Timna, nʼihi na a kpọnyere enyi ya nwunye ya.” Nʼihi nke a, ndị Filistia niile zukọtara kpọpụta nwaagbọghọ ahụ na nna ya kpọọ ha ọkụ.
JDG 15:7 Ma Samsin gwara ha okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu mere ihe dị otu a, agaghị akwụsị tutu m bọrọ ọbọ ihe ọjọọ unu mere.”
JDG 15:8 Ya mere, ọ pụkwuru ha ọzọ, site nʼoke iwe, gbuo ọtụtụ mmadụ nʼime ha. Mgbe nke a gasịrị, ọ gara biri nʼime otu ọgba nkume nke Etam.
JDG 15:9 Ndị Filistia gara maa ụlọ ikwu ha nʼala Juda, gbasaa nʼala ahụ ruo obodo Lehi.
JDG 15:10 Ndị Juda jụrụ ajụjụ sị ha; “Ọ bụ gịnị mere unu ji bịa nʼebe a ibuso anyị agha?” Ha zara sị, “Anyị na-achọ ijide Samsin, ka anyị megwara ya ihe ọjọọ o mere anyị.”
JDG 15:11 Nʼihi nke a, ndị Juda zipụrụ puku ndị agha ka ha gaa jide Samsin nʼọgba nkume ahụ nke Etam. Ndị a bịara jụọ Samsin ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Ọ bụ na ị maghị na ndị Filistia na-achị obodo anyị?” Samsin zara sị ha, “Ihe m mere bụ imegwata ha ihe ha mere m.”
JDG 15:12 Ha sịrị ya, “Anyị abịala ka anyị kee gị agbụ, dọkpụrụ gị, nye nʼaka ndị Filistia.” Samsin sịrị ha, “Ṅụọrọnụ m iyi na unu agaghị eji aka unu gbuo m.”
JDG 15:13 Ha zara sị ya, “Anyị agaghị egbu gị kama anyị ga-eke gị agbụ.” Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya jekwuru ndị Filistia.
JDG 15:14 Mgbe ọ na-abịaru Lehi, ndị Filistia tiiri mkpu, bịa izute ya. Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼebe ọ dị ukwuu. Nke a mere ka eriri ahụ e kere ya nʼaka dịrị ka eriri ogho flakisi erere ọkụ, sitekwa nʼaka ya dapụsịa.
JDG 15:15 Mgbe ahụ Samsin lere anya gburugburu, hụ ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu nke tọgbọrọ nʼala nʼebe ahụ. Ọ tụtụlitere ya, were ya tigbuo puku ndị agha Filistia.
JDG 15:16 Mgbe ahụ, Samsin kwuru sị, “E ji m agba ịnyịnya ibu mee ka ha dị ka ịnyịnya ibu. E ji m agba ịnyịnya ibu tigbuo puku ndị ikom.”
JDG 15:17 Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o tufuru ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu ahụ; a kpọkwara ebe ahụ Ramat Lehi.
JDG 15:18 Nʼoge a, akpịrị kpọrọ Samsin nkụ nke ukwuu, nʼihi ya, ọ kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Lee, i nyela ohu gị mmeri a dị ukwuu! Ma ugbu a, ị ga-ekwe ka m nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nku, si otu a daba nʼaka ndị a na-ebighị ugwu?”
JDG 15:19 Chineke gbawara olulu ahụ nke dị nʼime Lehi, mee ka mmiri si na ya nupụta. Mgbe Samsin ṅụrụ mmiri ahụ, ike ya lọghachiri, mmụọ ya bịaghachikwara. Ya mere, a kpọrọ isi iyi ahụ En-Hakkore. Mmiri ala ahụ ka dịkwa na Lehi nʼebe ahụ ruo taa.
JDG 15:20 Ya mere, Samsin kpere ụmụ Izrel ikpe iri afọ abụọ nʼoge ndị Filistia.
JDG 16:1 Otu ụbọchị, Samsin gara nʼotu obodo ndị Filistia a na-akpọ Gaza, soro otu nwanyị akwụna bi nʼebe ahụ hie ụra abalị.
JDG 16:2 A gwara ndị Gaza sị, “Samsin nọ nʼobodo a.” Nʼihi ya, ha gbara ebe ahụ gburugburu ma nọdụ na-eche nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ abalị niile. Ọ dịghị ihe ha mere nʼabalị ahụ nʼihi na ha zubere sị, “Mgbe chi bọrọ, anyị ga-egbu ya.”
JDG 16:3 Ma Samsin dinara nʼụlọ nwanyị akwụna ahụ ruo nʼetiti abalị ahụ. Mgbe ọ pụtara, ọ gara ruo nʼọnụ ụzọ obodo ahụ, foro ibo ọnụ ụzọ obodo ahụ, ya na ibo ya abụọ, bukwasị ya nʼubu ya, buru ha gaa nʼelu ugwu chere obodo Hebrọn ihu.
JDG 16:4 Ọ dịghị anya, Samsin hụrụ otu nwaagbọghọ, onye ọ hụrụ nʼanya. Aha nwaagbọghọ a bụ Delaịla, onye si nʼobodo dị na Ndagwurugwu Sorek.
JDG 16:5 Ndị eze ndị Filistia, bịakwutere Delaịla rịọọ ya sị, “Gbalịa lee ma ị ga-enwe ike chọpụta ebe ike Samsin si abịa, ka anyị nwee ike ịmata ụzọ anyị ga-esi jide ya, kee ya agbụ. Ọ bụrụ na i meere anyị nke a, anyị na-ekwe nkwa na onye ọbụla nʼime anyị ga-enye gị puku shekel na narị shekel ọlaọcha.”
JDG 16:6 Nʼihi nke a, Delaịla gwara Samsin okwu sị ya, “Gwa m ebe ike gị si abịa. Gwakwa m otu mmadụ pụrụ isi kee gị agbụ, merie gị.”
JDG 16:7 Mgbe ahụ, Samsin zara sị ya, “Ọ bụrụ na mmadụ e jiri akwara eriri asaa dị ọhụrụ, ndị a na-amịkpọghị amịkpọ kee m, m ga-abụkwa onye na-adịghị ike dịka mmadụ ọbụla ọzọ.”
JDG 16:8 Ngwangwa, ndịisi ndị Filistia wetara ya eriri asaa dị ọhụrụ ndị a na-amịbeghị nʼanwụ, o weere ha kee Samsin.
JDG 16:9 Ma o mere ka ụfọdụ ndị ikom Filistia zoo onwe ha nʼotu akụkụ ụlọ ya. O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị!” Otu mgbe ahụ kwa, Samsin biliri dọbisie eriri ahụ dịka ọ bụ eriri e ji ogho mee nke bịara ọkụ nso. Ya mere, a chọpụtaghị ebe ike Samsin si abịa.
JDG 16:10 Emesịa, Delaịla gwara Samsin sị ya, “Lee, ị kwaala m emo, ghaara m ụgha. Biko, gwa m ụzọ a ga-esi kee gị agbụ.”
JDG 16:11 Samsin zara sị ya, “Lee, ọ bụrụ na e jiri ụdọ ọhụrụ nke a na-ejibeghị kee ihe mgbe ọbụla, kee m, aga m adịkwa dịka ndị ọzọ.”
JDG 16:12 Ya mere, Delaịla chịkọtara ụdọ ọhụrụ jiri ya kee ya nke ọma. Ma ụfọdụ ndị ikom Filistia zokwara onwe ha nʼime ime ụlọ ahụ. Ọzọkwa, Delaịla tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma Samsin biliri dọbisie eriri ahụ e ji kee ya ka a ga-asị na ọ bụ ogho ka e ji mee ha.
JDG 16:13 Mgbe ahụ, Delaịla gwara ya sị, “Lee, ị na-eme ka abụ m onye nzuzu, ghaara m ụgha. Gwa m eziokwu, otu a ga-esi kee gị agbụ.” Samsin zara sị ya, “Lee, e kewara agịrị isi dị m nʼisi ụzọ asaa, i were ụzọ nkekọta asaa e kekọtara agịrị isi m, kpanyekọtaa ha nʼihe i ji ekwe akwa, were ntu osisi i ji akpachi akwa kpachie ya, mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.” Mgbe Samsin rahụrụ ụra, Delaịla weere agịrị isi Samsin kpanyekọtaa ya nʼihe o ji ekwe akwa.
JDG 16:14 O jikwa ǹtu osisi o ji akpachi akwa, kpachikọtasie agịrị isi Samsin ike. Ọzọ, Delaịla sịrị ya, “Samsin, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma Samsin bilitere nʼike fokọrọ ǹtu osisi ahụ, na ihe eji akpa akwa, na akwa akpara akpa.
JDG 16:15 Mgbe ahụ, Delaịla gwara ya okwu sị, “Olee ka i si kwuo na ị hụrụ m nʼanya, ebe ọ bụ na i nweghị ike ịgwa m ihe dị gị nʼobi? Lee, ugbo atọ ndị a, i mere m ka m dịka onye nzuzu, ma ị gwabeghị m ebe ike gị dị ruo ugbu a.”
JDG 16:16 Delaịla sikwara otu a nyegide Samsin nsogbu tutu ruo mgbe Samsin na-enweghịkwa ike ịnagide nsogbu ya.
JDG 16:17 Ya mere, ọ gwara ya ihe niile, “Ọ dịbeghị mgbe agụba ọbụla gara nʼelu isi m, nʼihi na abụ m onye Nazirait, onye e doro nsọ nye Chineke ka m bụ, site nʼafọ nne m. Ọ bụrụkwa na a kpụchapụ agịrị isi m, mgbe ahụ, ike niile dị m nʼahụ ga-apụ. Mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.”
JDG 16:18 Mgbe Delaịla matara na ọ gwala ya ihe niile, o ziri ozi kpọọ ndịisi ndị Filistia ahụ, sị, “Bịaghachinụ otu ugbu a, nʼihi na ọ gwara m ihe niile.” Ya mere, ndịisi ndị Filistia lọghachiri jiri ego ọlaedo ahụ nʼaka ha.
JDG 16:19 Ma Delaịla mere ka o dinaa nʼapata ụkwụ ya rahụ ụra. Mgbe ahụ, ọ kpọbatara nwoke na-akpụcha isi, ka ọ kpụchapụ agịrị isi niile dị Samsin nʼisi, si otu a mee ka ike ghara ịdịkwa ya. Ike ya hapụrụ ya.
JDG 16:20 O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma mgbe Samsin bilitere site nʼụra, o chere nʼobi ya, “Aga m apụ ka m si mee na mbụ megharịa arụ ma nwere onwe m.” Ma ọ maghị na Onyenwe anyị ahapụla ya.
JDG 16:21 Ndị Filistia jidere ya, ghụpụ ya anya ya abụọ, duru ya gbadata Gaza. Nʼebe ahụ, ha jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nye ya ọrụ ịnyagharị igwe na-akwọ ọka nʼụlọ mkpọrọ ha tinyere ya.
JDG 16:22 Mgbe na-adịghị anya, agịrị isi ya malitekwara ito ọzọ.
JDG 16:23 Ugbu a, ndịisi ndị Filistia niile zukọtara ịchụrụ chi ha bụ Dagọn, aja dị ukwuu, na ịṅụrị ọṅụ, na-asị, “Chi anyị enyela Samsin bụ onye iro anyị nʼaka anyị.”
JDG 16:24 Mgbe ndị mmadụ hụrụ ya, ha toro chi ha sị, “Chi anyị enyela onye iro anyị nʼaka anyị, onye mere ka ala anyị tọgbọrọ nʼefu gbukwaa ọtụtụ ndị anyị.”
JDG 16:25 Mgbe ha ka nọ nʼobi ụtọ, ha tiri mkpu sị, “Dupụtara anyị Samsin, ka o kpaa anyị ọchị.” Ya mere, e dupụtara Samsin site nʼụlọ mkpọrọ ka o meere ha ihe egwuregwu. Ha mere ka o guzo nʼetiti ebe ogidi e ji wuo ụlọ ahụ dị.
JDG 16:26 Mgbe ahụ, Samsin sịrị onye na-eji ya nʼaka sị, “Debe m nʼebe m ga-emetụ ogidi ndị ụlọ a na-eguzo na ha aka, ka m nwe ike dabere na ha.”
JDG 16:27 Nʼoge a, mmadụ ejupụtala nʼime ụlọ ahụ, nwoke na nwanyị; ndịisi ọchịchị ndị Filistia nọkwa nʼebe ahụ. Ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha ruru puku atọ, nwoke na nwanyị, nọ nʼelu ụlọ ahụ na-ele Samsin, ebe ọ na-emere ha ihe ọchị.
JDG 16:28 Mgbe ahụ, Samsin kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “O! Onyenwe m Onyenwe anyị, biko cheta m naanị otu ugbu a. Biko, Chineke, nye m ike nʼotu ohere a m nwere, ka m nwee ike ịbọrọ ọbọ nʼahụ ndị Filistia nʼihi, ọ bụladị, mkpụrụ anya m abụọ.”
JDG 16:29 Mgbe ahụ, Samsin jidesiri ogidi abụọ dị nʼetiti ụlọ ahụ aka ike, aka nri ya nʼotu, aka ekpe ya na nke ọzọ.
JDG 16:30 Samsin kpere ekpere sị, “Ka m soro ndị Filistia nwụọ!” O ji ike ya niile nuo ogidi ahụ aka. Otu mgbe ahụ kwa, ụlọ arụsị ahụ dara, dakwasị ndịisi ọchịchị Filistia ndị ahụ, na ndị niile nọ nʼime ụlọ ahụ. Ya mere, ndị niile so Samsin nwụọ nʼoge ahụ dị ọtụtụ karịa ndị Samsin gburu mgbe ọ dị ndụ.
JDG 16:31 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụnna ndị ikom Samsin, na ndị ezinaụlọ nna ya bịara nʼebe ahụ, buru ozu ya. Ha liri ya nʼagbata Zora na Eshtaol, ebe e liri nna ya Manoa. Samsin kpere ụmụ Izrel ikpe iri afọ abụọ.
JDG 17:1 E nwere otu nwoke si nʼala ugwu ugwu Ifrem, aha ya bụ Maịka.
JDG 17:2 Otu ụbọchị, Maịka gwara nne ya okwu sị ya, “I chetara puku na narị ego ọlaọcha shekel ndị ahụ funarịrị gị, nke i ji nʼihi ya bụọ onye zuru ya ọnụ nʼoge gara aga? Eji m ọlaọcha ahụ. Ọ bụ m weere ya.” Nne ya sịrị, “Ka Onyenwe anyị gọzie gị nwa m!”
JDG 17:3 Mgbe o nyeghachiri nne ya puku na narị ego ọlaọcha shekel ahụ, nne ya gwara ya sị, “Ana m edo ọlaọcha ndị a nsọ nye Onyenwe anyị nʼihi nwa m nwoke maka iji ya mee oyiyi a pịrị apị na arụsị a kpụrụ akpụ. Aga m emesịa nyeghachi gị ya.”
JDG 17:4 Ya mere, o nyeghachiri nne ya ọlaọcha ahụ, Nne ya weere narị ego ọlaọcha shekel abụọ wegara ọkpụ ụzụ ọlaọcha, onye jiri ya mee oyiyi a pịrị apị na ihe a kpụrụ akpụ. E tinyere ha nʼụlọ Maịka.
JDG 17:5 Nwoke ahụ bụ Maịka nwere ụlọ arụsị, o mere efọọd na arụsị ezinaụlọ dị iche iche, mee otu nʼime ụmụ ya ndị ikom ka ọ bụrụ onye nchụaja ya.
JDG 17:6 Nʼụbọchị ndị a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼihi nke a, onye ọbụla na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ, na ihe ọbụla dị ya mma nʼanya.
JDG 17:7 Otu nwokorobịa onye Livayị, sitere nʼobodo Betlehem nke dị na Juda, bụ onye binyere ndị agbụrụ Juda,
JDG 17:8 hapụrụ obodo ahụ, bụ Betlehem Juda ịchọ ọnọdụ nʼebe ọzọ. Mgbe ọ na-aga, ọ bịaruru nʼụlọ Maịka nʼala ugwu ugwu Ifrem.
JDG 17:9 Maịka jụrụ ya, “Ebee ka i si bịa?” Ọ sịrị “Abụ m onye Livayị si Betlehem dị na Juda. Ana m achọrọ onwe m ebe m ga-anọ.”
JDG 17:10 Mgbe ahụ, Maịka sịrị ya, “Soro biri nʼụlọ m, ghọkwara m nna na onye nchụaja, aga m akwụ gị mkpụrụ ego ọlaọcha shekel iri kwa afọ, nyekwa gị uwe, na ihe oriri.”
JDG 17:11 Ya mere, onye Livayị ahụ kwere nʼihe ọ gwara ya, nwokorobịa ahụ sooro ya biri ka otu nʼime ụmụ ya ndị ikom.
JDG 17:12 Mgbe ahụ, Maịka nyere onye Livayị ahụ ọrụ, nwokorobịa ahụ ghọọrọ ya onye nchụaja, birikwa nʼụlọ ya.
JDG 17:13 Mgbe ahụ, Maịka kwuru, “Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị ga-agọzi m nke ukwuu, nʼihi na onye Livayị a aghọọla onye nchụaja m.”
JDG 18:1 Nʼoge ahụ kwa, ụmụ Izrel enweghị eze ọbụla na-achị ha. Ebo Dan na-achọkwara onwe ha ebe obibi nke ga-abụ ala nke aka ha, nʼihi na ruo ugbu a, ha enwebeghị ike chụpụ ndị bi nʼala ahụ e kenyere ha dịka ihe nketa nke ha.
JDG 18:2 Nʼihi nke a, ebo Dan sitere nʼikwu ise dị nʼebo ha họpụta mmadụ ise. Ndị a bụ dimkpa, na dike nʼagha, bụrụkwa ndị si nʼobodo Zora na Eshtaol. Ha zipụrụ mmadụ ise ndị a ka ha gaa nyochaa ala ahụ ha na-achọ ibi nʼime ya. Mgbe ndị ahụ jeruru obodo ugwu ugwu Ifrem, ha gara nọdụ ọdụ abalị nʼụlọ Maịka.
JDG 18:3 Mgbe ha nọ nso ụlọ Maịka, ha nụrụ asụsụ nwokorobịa onye Livayị ahụ bụ onye nchụaja. Ha kpọpụtara ya nʼotu akụkụ jụọ ya ajụjụ sị, “Onye kpọtara gị ebe a? Gịnị ka ị na-eme nʼebe a? Gịnị mere i ji bịa nʼebe a?”
JDG 18:4 Nwokorobịa ahụ kọwara ha ihe Maịka meere ya. Ọ gwara ha, “O nyere m ọrụ, abụkwa m onye nchụaja ya.”
JDG 18:5 Ha sịrị ya, “Ọ dị mma! Biko, jụta Chineke ase, chọpụta ma ije anyị a ọ ga-agakwa nke ọma.”
JDG 18:6 Onye nchụaja ahụ zara sị ha, “Gaa nʼudo. Ije unu nwere ngọzị Onyenwe anyị.”
JDG 18:7 Ya mere, ndị ikom ise ndị ahụ biliri ije bịaruo nʼobodo Laish, ebe ha hụrụ na ndị ahụ na-ebi nʼudo, na-enweghị nsogbu ọbụla. Ha dịka ndị obodo Saịdọn, ndị onwe ha juru afọ, ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla. Ha bụ ndị bara ụba, ebe ọ dịghị ihe ọbụla kọrọ ụkọ nʼala ahụ. Ọzọ, ha bi nʼebe dị anya site nʼobodo ndị Saịdọn. Ọ dịkwaghị ihe ha na mmadụ ọbụla nwekọrọ.
JDG 18:8 Mgbe ndị nnyocha ahụ laghachiri nʼobodo Zora na Eshtaol, ndị ebo Dan ibe ha jụrụ ha, sị, “Unu si aṅaa jee? Gịnị ka unu chọpụtara?”
JDG 18:9 Ha zara sị, “Bịanụ, ka anyị gaa buso ha agha. Anyị ahụla ala ahụ, ọ dịkwa mma nke ukwu. Gịnị ka unu na-agbara nkịtị? Unu egbula oge ịba nʼebe ahụ nweta ya.
JDG 18:10 Mgbe unu ruru ebe ahụ, unu ga-ahụ ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla, na ala sara mbara nke Chineke na-etinye unu nʼaka. Ala nke ihe ọbụla na-adịghị akọ nʼime ya.”
JDG 18:11 Ya mere, narị ndị agha isii ndị si nʼebo Dan biliri gaa ibuso obodo ahụ agha. Ha sikwa Zora na Eshtaol pụọ.
JDG 18:12 Mgbe ha na-aga, ha rutere Kiriat Jearim, nke dị na Juda, maa ụlọ ikwu ha nʼebe ahụ. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ebe ahụ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Kiriat Jearim Mahane Dan ruo taa.
JDG 18:13 Emesịa, ha pụrụ nʼala ugwu ugwu Ifrem, bịarute nʼụlọ Maịka.
JDG 18:14 Mmadụ ise ndị ahụ gara nnyochapụta ala (ya bụ ala Laish) ahụ gwara ụmụnna ha sị, “Unu maara na nʼime otu ụlọ ndị a na e nwere efọọd, nʼụfọdụ arụsị ezinaụlọ ndị dị iche iche, na oyiyi a kpụrụ akpụ nke eji ọla wuo? Ugbu a, maranụ ihe unu ga-eme.”
JDG 18:15 Ya mere, ha gara nʼebe ahụ, banye nʼụlọ nwokorobịa Livayị ahụ, ebe o bi nʼụlọ Maịka, jụọ ya maka ọdịmma ya.
JDG 18:16 Narị ndị ikom Dan, ndị jikere ibu agha, guzo nʼọnụ ụzọ ama.
JDG 18:17 Mgbe ahụ, ndị nnyocha ise ahụ banyere nʼime ụlọ ahụ buru arụsị ọla ahụ, na efọọd ahụ, na arụsị ezinaụlọ ndị ahụ, ma onye nchụaja ahụ na narị ndị agha isii ndị ji ngwa agha guzo nʼọnụ ụzọ ama.
JDG 18:18 Mgbe ndị ikom ahụ banyere nʼụlọ Maịka buru arụsị ọla ahụ, efọọd ahụ na arụsị ezinaụlọ ndị ọzọ ahụ, onye nchụaja ahụ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-eme?”
JDG 18:19 Ha zara sị ya, “Mechie ọnụ gị! Ekwukwala okwu ọbụla. Soro anyị bịa bụrụ nna anyị na onye nchụaja anyị. Ọ ga-abara gị uru karịa ịbụ onye nchụaja nye otu ebo na otu agbụrụ nʼIzrel, karịa ịbụ onye nchụaja nke naanị otu nwoke nʼime ezinaụlọ ya.”
JDG 18:20 Mgbe ahụ, obi tọrọ nwokorobịa onye nchụaja ahụ ụtọ isoro ha gaa. O buuru efọọd ahụ, arụsị ezinaụlọ ndị ọzọ ahụ na oyiyi ahụ a pịrị apị soro ndị ahụ gawa.
JDG 18:21 Ha malitekwara ije ha, ụmụntakịrị ha, na igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha ka ha tinyere nʼihu ha.
JDG 18:22 Mgbe ha gamitụrụ nke nta site nʼụlọ Maịka, ndị ikom ndị bi nso ụlọ Maịka kpọkọtara onwe ha chụso ndị Dan, gafee ha.
JDG 18:23 Maịka na ndị so ya na-etikwa mkpu na-akpọku ha sị ha kwụsị ije ha. Ma ndị ebo Dan jụrụ Maịka ajụjụ sị ya, “Gịnị na-eme gị iji kpọpụta ndị gị ka ha bịa lụso anyị agha?”
JDG 18:24 Ọ zaghachiri, “Unu chịịrị chi ndị m mere, kpọrọ onye nchụaja m pụọ. Gịnị ọzọ ka m nwekwara? Olee otu unu si ajụ, ‘Gịnị na-eme gị?’ ”
JDG 18:25 Ndị ikom Dan zara sị ya, “Lezie anya kpachara anya banyere ụdị okwu ị na-ekwu. Nʼihi na i kwuo ụdị okwu a gaa nʼihu, ụfọdụ ndị ikom isi na-anụ ọkụ ga-abịa lụso gị agha gbuo gị na ndị ezinaụlọ gị.”
JDG 18:26 Ya mere, ndị ebo Dan gbara ya nkịtị na-aga ebe ha na-aga. Mgbe Maịka hụrụ na ha dị ọtụtụ karịa ya, ọ hapụrụ ha, tụgharịa laghachi nʼụlọ ya.
JDG 18:27 Ụmụ Dan chịịrị arụsị ahụ niile Maịka mere, durukwa onye nchụaja ya gawa nʼobodo Laish, obodo nọ nʼudo, nke na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla. Ha busoro ndị obodo ahụ agha, suo obodo ahụ ọkụ.
JDG 18:28 Ọ dịghị onye ọbụla nwere ike bịa inyere ndị obodo ahụ aka nʼihi ha bi nʼebe dị anya site nʼobodo Saịdọn. O nwekwaghị obodo ọbụla ha na ha na-emekọrịta. Obodo a dị na ndagwurugwu dị nso na Bet-Rehob. Emesịa, ndị ebo Dan wughachiri obodo ahụ ọzọ, biri nʼime ya.
JDG 18:29 Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ aha obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna ha ochie, onye bụ nwa Izrel. Ma tupu ebo Dan ebibie ya, aha obodo a nʼoge gara aga bụ Laish.
JDG 18:30 Nʼebe ahụ ndị Dan guzobeere onwe ha arụsị, Jonatan, nwa Geshọm, nwa Mosis, na ụmụ ya ndị ikom niile ghọọrọ ndị nchụaja nye ebo Dan ruo nʼoge a dọtara ala ahụ nʼagha.
JDG 18:31 Ndị ebo Dan nọgidere na-efe arụsị ndị ahụ Maịka mere oge ahụ niile ụlọ nzute Chineke dị na Shaịlo.
JDG 19:1 Nʼoge a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼoge ahụ kwa, ọ dị otu nwoke, onye Livayị bi nʼebe dị anya nʼala ugwu ugwu Ifrem. Nwoke a gara Betlehem, nʼime Juda, kpọrọ otu nwaagbọghọ ka ọ bụrụ iko ya nwanyị.
JDG 19:2 Ma iko ya nwanyị ahụ kwara iko megide ya. Ọ hapụrụ ya laghachi nʼezinaụlọ nne na nna ya na Betlehem, Juda. Ọ nọrọ ọnwa anọ nʼebe ahụ.
JDG 19:3 Nwoke ahụ kpebiri ịga nʼụlọ nna nwaagbọghọ ahụ ịrịọ ya ka ọ lọghachi. Ọ kpọọrọ otu nʼime ndị ohu ya, duru ịnyịnya ibu abụọ. Mgbe nwoke ahụ bịaruru nʼụlọ ahụ, iko ya nwanyị kpọbatara ya nʼụlọ nna ya. Mgbe nna nwaagbọghọ ahụ hụrụ ya, o jiri ọṅụ kelee ya ekele.
JDG 19:4 Nna nwanyị ahụ rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụfọdụ oge. Nʼihi nke a, ọ nọnyeere ha ụbọchị atọ. Ha niile nọrọ ọnọdụ obi ụtọ abalị atọ ahụ niile, rie ṅụọkwa.
JDG 19:5 Nʼụbọchị nke anọ, nwoke ahụ na iko ya jikeere nʼisi ụtụtụ ịlaghachi. Ma nna nwanyị ahụ rịọrọ ha sị ha, “Jirinụ ihe oriri gbaanụ onwe unu ume. Emesịa unu nwere ike ịlawa.”
JDG 19:6 Ya mere, ha abụọ nọdụrụ ala rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ. Mgbe e mesiri, nna nwaagbọghọ ahụ sịrị ha, “Biko, nọdụnụ rahụ ụra nʼabalị taa, meekwanụ onwe unu obi ụtọ.”
JDG 19:7 Ma mgbe nwoke ahụ biliri ka ọ laa, nna nwaagbọghọ ahụ, nọgidere ya, nke a mere ka o kwenye ịnọ ruo echi ya.
JDG 19:8 Nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke ise, ha bilikwara ngwangwa jikere ịhapụ ma ịlaghachi. Ọzọkwa, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, nọgidenụ nʼụtụtụ taa, ma nʼoge ehihie unu nwere ike laa.” Nʼihi nke a, ha nọgidekwara rie, ṅụọ.
JDG 19:9 Mgbe nwoke ahụ na iko ya nwanyị, na ohu ya, jikeere ịhapụ, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, lee chi ebidola iji ugbu a, abalị adịkwala nso. Biko, nọgide nʼụlọ m naanị abalị taa. Anyị ga-emekwa onwe anyị obi ụtọ abalị taa niile. Ma unu ga-amalite ije unu nʼisi ụtụtụ echi. Mgbe ahụ, unu ga-ala nʼudo.”
JDG 19:10 Ma nwoke ahụ ekweghị ịnọ ọnọdụ abalị ọzọ, ọ hapụrụ gawa nʼụzọ ije Jebus (ya bụ Jerusalem), ya na ịnyịnya ibu ya abụọ akwadoro maka njem nakwa iko ya nwanyị.
JDG 19:11 Ha rutere ebe ahụ oge chi na-akwado iji. Ohu ya sịrị nna ya ukwu, “Bịa, ka anyị kwụsị nʼobodo ndị Jebus a, nọ ọnọdụ abalị.”
JDG 19:12 Ma nna ya ukwu zaghachiri, “Mba! Anyị agaghị aba nʼobodo ndị na abụghị ụmụ Izrel. Anyị ga-aga nʼihu ruo Gibea.”
JDG 19:13 O kwukwara sị, “Bịa ka anyị gbalịa iru Gibea maọbụ Rema, nọọ ọnọdụ abalị nʼotu nʼime ebe ndị a.”
JDG 19:14 Ya mere, ha gara nʼihu nʼije ha. Anwụ dara dịka ha na-eru Gibea dị na Benjamin.
JDG 19:15 Nʼebe ahụ ka ha kwụsịrị ịnọ ọnọdụ abalị. Ha gara nọrọ na mbara ama obodo ahụ, ma o nweghị onye ọbụla kpọbatara ha ka ha rahụ ụra nʼụlọ ya.
JDG 19:16 Nʼanyasị ahụ, otu agadi nwoke zutere ha ka o si ịrụ ọrụ nʼubi na-alọghachi, onye si nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, ma o bi ka onye ọbịa na Gibea (ndị bi nʼebe a bụ ndị Benjamin).
JDG 19:17 Mgbe agadi nwoke a hụrụ ndị ije ahụ na mbara ama obodo ahụ, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Ebee ka unu si bịa? Ebee ka unu na-aga?”
JDG 19:18 Nwoke ahụ zara sị ya, “Anyị si Betlehem dị na Juda na-alọghachi nʼụlọ anyị dị nʼebe dị anya nʼala ugwu ugwu Ifrem. Esi m ebe ahụ gaa Betlehem dị na Juda, ma ugbu a, ana m aga nʼụlọ Onyenwe anyị. O nweghị onye kpọbatara anyị nʼụlọ ya.
JDG 19:19 Anyị nwere ihe oriri nke ịnyịnya ibu anyị ga-eri, achịcha na mmanya nke anyị bụ ndị ohu gị ga-eri, ya bụ, mụ onwe m na ohu gị nwanyị na nwokorobịa so anyị. Anyị achọghị ihe ọbụla nʼaka onye ọbụla.”
JDG 19:20 Agadi nwoke ahụ sịrị ha, “Batanụ nʼụlọ m dịka ndị ọbịa nke m. Ka m nye unu ihe niile bụ mkpa unu. Naanị unu anọla ọnọdụ abalị nʼama.”
JDG 19:21 Nʼihi nke a, ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya. O duuru ịnyịnya ibu ha, nye ha ihe oriri. Emesịa, ha sara ụkwụ ha mmiri, nọdụ ala rie ma ṅụọkwa.
JDG 19:22 Ma mgbe ha risiri nri, nọrọ na-ezu ike, na-akpakọrịta ụka, na mberede, ndị ikom ụfọdụ sitere nʼobodo ahụ, ndị jọgburu onwe ha nʼomume gbara ụlọ ahụ gburugburu. Ha malitekwara iti aka nʼụzọ ahụ na iti mkpu na-akpọku agadi nwoke ahụ, sị ya, “Kpọpụta onye ọbịa ahụ nọ nʼime ụlọ gị ka anyị mara ya.”
JDG 19:23 Agadi nwoke ahụ bụ onyenwe ụlọ ahụ pụkwuuru ha nʼezi, sị ha, “Biko ụmụnna m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a. Nwoke a nọ nʼụlọ m dịka ọbịa. Unu emela ihe ihere dị otu a.
JDG 19:24 Ka m kpọpụtara unu nwa m nwanyị na-amaghị nwoke, na iko nwanyị nwoke a ka unu jiri ha mee ihe ọbụla unu chọrọ ma hapụnụ nwoke a. Unu emela ihe ihere dị otu a.”
JDG 19:25 Ma ndị ikom ahụ egeghị ya ntị. Ya mere, nwoke ahụ kpọpụtara iko ya nwanyị zipụrụ ha ya nʼezi. Ha niile nʼotu na otu, dinakwuru nwanyị ahụ abalị ahụ niile. Mgbe chi na-achọ ịbọ, ha hapụrụ ya ka ọ laa.
JDG 19:26 Nʼisi ụtụtụ, nwanyị ahụ biliri laghachi azụ nʼụlọ ahụ iko ya nwoke nọ. Ma ọ dara nʼala nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ ahụ tọgbọrọ nʼebe ahụ tutu chi abọzie.
JDG 19:27 Mgbe nwoke ahụ biliri nʼụtụtụ, meghee ụzọ ka ọ malite ije ya, ọ hụrụ iko ya nwanyị ahụ ka ọ tọgbọ nʼọnụ ụzọ ahụ. Aka ya abụọ dịkwa nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ ahụ.
JDG 19:28 Nwoke ahụ kpọkuru ya sị ya, “Ngwa, bilie ka anyị laa.” Ma nwaagbọghọ ahụ ekwughị okwu ọbụla. Nwoke ahụ buliri ya, tụkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya laa nʼobodo nke aka ya.
JDG 19:29 Mgbe ọ bịaruru obodo ya, ọ banyere nʼụlọ ya wepụta mma jiri ya bọwaa ozu iko ya nwanyị ahụ ụzọ iri na abụọ. O zigaara ebo iri na abụọ niile dị nʼIzrel otu ụzọ, otu ụzọ.
JDG 19:30 Nʼihi nke a, Onye ọbụla hụrụ ihe ọjọọ a kwuru sị, “O nwebeghị onye ọbụla mere ụdị ajọ omume dị otu a kemgbe ụmụ Izrel si nʼobodo Ijipt pụta. Chee echiche banyere ihe a. Tulee ya ma gwa anyị ihe anyị ga-eme?”
JDG 20:1 Mgbe ahụ, ndị Izrel niile ndị si nʼala Dan ruo Bịasheba, tinyere ndị si nʼala Gilead, pụtara dịka otu mmadụ, bịa zukọọ nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa.
JDG 20:2 Ndị ndu ebo Izrel niile weere ọnọdụ na nzukọ nke ndị Chineke, ọnụọgụgụ ha bụ narị puku ndị agha anọ, ndị na-ebu mma agha.
JDG 20:3 Mgbe na-adịghị anya, nzukọ ụmụ Izrel niile na Mizpa ruru ụmụ Benjamin ntị. Mgbe ahụ, ndịisi Izrel niile kpọrọ nwoke ahụ e gburu iko ya nwanyị sị ya, “Kọọrọ anyị otu ihe ọjọọ a si mee.”
JDG 20:4 Ya mere, onye Livayị ahụ, di nwanyị ahụ e gburu kwuru sị, “Mụ na iko m nwanyị bịaruru obodo Gibea, obodo nta ndị Benjamin, kwụsị nʼebe ahụ ịnọ ọnọdụ abalị.
JDG 20:5 Nʼoge abalị, ndị ikom Gibea bịara gba ụlọ anyị nọ nʼime ya gburugburu. Nzube ha bụ igbu m. Ma ha jidere iko m nwanyị, dinakwuru ya nʼike, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ.
JDG 20:6 Nʼihi ya, abọwasịrị m ahụ iko m nwanyị ụzọ iri na abụọ, zisa ya nʼakụkụ niile nke ihe nketa ndị Izrel niile nʼihi na ndị ikom Gibea ndị ahụ emeela ihe ọjọọ na ihe ihere nʼala Izrel.
JDG 20:7 Ugbu a, unu ụmụ Izrel niile, unu onwe unu tụleenụ okwu a, nyekwanụ ndụmọdụ ihe a ga-eme ebe a.”
JDG 20:8 Ndị mmadụ niile kulitere dịka otu onye, sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ala na be ya. O nweghị onye ọbụla ga-esi nʼebe a laa nʼụlọ ya.
JDG 20:9 Ma ugbu a, nke a bụ ihe anyị ga-eme ndị Gibea. Anyị ga-efe nza chọpụta ndị ga-aga lụso ndị Gibea agha.
JDG 20:10 Anyị ga-esite nʼebo niile nke Izrel họpụta mmadụ iri site na narị mmadụ, họpụta narị mmadụ site na puku mmadụ, họpụtakwa puku mmadụ site nʼiri puku mmadụ, ka ha hụ maka iwetara ndị agha ihe oriri. Mgbe ndị agha a rutere Geba dị na Benjamin, anyị pụrụ ịkwụghachi ha ụgwọ ruru ha dịka ihe ihere niile ha mere nʼala Izrel si dị.”
JDG 20:11 Ya mere, ndị Izrel niile jikọtara onwe ha ọnụ ibu agha ahụ dịka otu onye, megide obodo ahụ.
JDG 20:12 Ndị ebo Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha gazuo ebo Benjamin niile, sị ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a jọgburu onwe ya emere nʼetiti unu?
JDG 20:13 Ugbu a, kpọpụtara anyị ndị ikom ọjọọ dị a si nʼobodo Gibea ka anyị gbuo ha. Anyị ga-esikwa otu a hichapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.” Ma ụmụ Benjamin egeghị ndị Izrel ibe ha ntị.
JDG 20:14 Ha sitere nʼobodo ha dị iche iche zukọtaa na Gibea maka ibuso ndị Izrel agha.
JDG 20:15 Nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin sitere nʼobodo ha dị iche iche kpọkọta iri puku ndị ikom abụọ na puku isii bụ ndị na-amịpụta mma agha, tinyere narị ndị ikom asaa ahụ zuruoke site na ndị bi na Gibea.
JDG 20:16 Nʼime ndị agha ndị a, e nwere narị ndị agha asaa, ndị a maara nke ọma dịka ndị na-agbata ụta nke ọma. Ha bụ ndị na-eme aka ekpe, onye ọbụla nʼime ha nwere ike iji okwute mata otu agịrị isi, ghara ịmahie ya.
JDG 20:17 Ma ọnụọgụgụ ndị agha ụmụ Izrel, ma ọ bụrụ na e wezuga ụmụ Benjamin, dị narị puku anọ.
JDG 20:18 Ma tupu agha ahụ ebido, ndị agha Izrel buru ụzọ gaa Betel ịjụta Chineke ase. Ha jụrụ ya sị, “Olee ebo ga-edu anyị ibuso ndị agha Benjamin agha?” Onyenwe anyị zara sị ha na ọ bụ Juda ga-ebu ụzọ.
JDG 20:19 Nʼihi nke a, nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị agha ụmụ Izrel niile buliri ihe agha ha pụọ, maa ụlọ ikwu ha nso nso Gibea.
JDG 20:20 Emesịa, ndị Izrel pụrụ izute ndị Benjamin, doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Gibea.
JDG 20:21 Ma nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin si Gibea nupụta nʼigwe gbuo ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ na puku abụọ.
JDG 20:22 Ndị agha Izrel gbarịtara onwe ha ume, ma werekwa ọnọdụ ibu agha dịka ha mere nʼụbọchị mbụ.
JDG 20:23 Ndị agha Izrel kwara akwa nke ukwuu nʼụbọchị ahụ nʼihu Onyenwe anyị site nʼụtụtụ ruo anyasị. Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ sị ya, “Anyị ga-aga nʼihu ịlụso ụmụnna anyị ndị Benjamin ọgụ?” Onyenwe anyị zara sị ha, “Gaanụ ga lụso ha agha.”
JDG 20:24 Nʼihi nke a, ndị Izrel jeghachikwara ọzọ ibuso ụmụ Benjamin agha nʼụbọchị nke abụọ ya.
JDG 20:25 Nʼoge a kwa, ndị agha Benjamin si nʼobodo Gibea pụta ibuso ha agha. Ha gburu ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ. Ndị a niile bụkwa ndị ji mma agha ebu agha.
JDG 20:26 Mgbe ahụ, ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ nʼebe ahụ, kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị Ha erighị nri ọbụla nʼụbọchị ahụ site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha chere nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja udo, ma chụọkwa aja nsure ọkụ.
JDG 20:27 Ndị Izrel jụrụ ase site nʼaka Onyenwe anyị. (Nʼoge ndị ahụ, igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼebe ahụ.
JDG 20:28 Finehaz nwa Elieza, nwa nwa Erọn na-eje ozi nchụaja nʼebe ahụ.) Ụmụ Izrel jụrụ Onyenwe anyị ase sị ya, “Ọ bụ anyị gaakwa ọzọ ibuso ụmụnna anyị ndị Benjamin agha, ka ị sị anyị agala?” Onyenwe anyị zara sị ha, “Gaanụ, nʼihi na aga m ahụ na unu meriri ndị agha Benjamin echi.”
JDG 20:29 Nʼihi nke a, ụmụ Izrel kewapụtara ndị zoro onwe ha nʼọhịa, gburugburu obodo Gibea.
JDG 20:30 Nʼụbọchị nke atọ ya, ha pụrụ gaakwa izute ndị Benjamin, ha were ọnọdụ ha imegide ndị Gibea dịka ha mere nʼoge gara aga.
JDG 20:31 Ndị Benjamin pụtara izute ha, e mere ka ha site nʼobodo pụọ. Ha malitere igbu ndị Izrel dịka ha mere na mbụ, nke mere na ndị ikom iri atọ dara nwụọ nʼọhịa ma na ụzọ, otu nke gawara obodo Betel, na nke ọzọ gawara obodo Gibea.
JDG 20:32 Ya mere, mgbe ndị agha Benjamin malitere na-asị, “Lee, anyị emeriela ha dịka anyị mere na mbụ,” ndị Izrel nọ na-ekwu sị, “Ka anyị gbara ọsọ na-aga ruo mgbe ha ga-anọ ebe dị anya site nʼobodo ha.”
JDG 20:33 Ndị ikom niile nke Izrel sitere nʼọnọdụ ha bilie, doo onwe ha nʼusoro na Baal-Tama, ndị Izrel ndị zoro onwe ha wapụtara site nʼọnọdụ ha nʼọdịda anyanwụ nke Geba, si nʼọhịa mapụta.
JDG 20:34 Iri puku ndị ikom Izrel ahụ zuruoke gara na ncherita ihu Gibea busoo ya agha. Agha ahụ dị ike nke ukwuu nke mere na ndị Benjamin amataghị na oke mbibi na-abịakwasị ha.
JDG 20:35 Onyenwe anyị meriri ndị Benjamin nʼihu Izrel, nʼụbọchị ahụ; ndị Izrel gburu ndị agha Benjamin ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ, na puku ise, na otu narị. Ha niile bụkwa ndị na-eji mma agha aga agha.
JDG 20:36 Mgbe ahụ, ndị Benjamin nʼonwe ha, hụrụ na e emeriela ha. Ugbu a, ndị ikom Izrel nyere ndị Benjamin ohere ịga nʼihu, nʼihi na ha dabere na ndị ha zoro nʼọhịa nʼakụkụ Gibea.
JDG 20:37 Ndị ahụ zoro nʼọhịa gbapụtara ọsịịsọ gbaba nʼobodo Gibea, kesaa onwe ha, were mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo ahụ.
JDG 20:38 Ndị Izrel na ndị zoro nʼọhịa kwekọtara na ha ga-eme ka anwụrụ ọkụ dị ukwuu na-ala elu elu site nʼobodo ahụ,
JDG 20:39 ma mgbe ahụ, ndị Izrel ga-ebido ịbọ ọbọ ogbugbu egburu ha. Ndị Benjamin egbuolarị iri ndị Izrel atọ, nʼihi ya ha sịrị, “Anyị na-emeri ha dịka anyị mere nʼagha mbụ.”
JDG 20:40 Ma mgbe anwụrụ ọkụ malitere ịla elu site nʼobodo ahụ, ndị Benjamin lere anya nʼazụ hụ ka anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼakụkụ niile nke obodo ahụ.
JDG 20:41 Mgbe ahụ, ndị Izrel bidoro igbu ha, oke egwu jidere ndị Benjamin nʼihi na ha ghọtara na ịla nʼiyi adakwasịla ha.
JDG 20:42 Ha si nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, gbaga nʼụzọ gawara nʼọzara, ma ha enweghị ike ịgbanarị agha ahụ. Ndị Izrel si nʼobodo Gibea gbapụta gburu ha nʼebe ahụ.
JDG 20:43 Ha gbara ndị Benjamin gburugburu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Gibea, gbuo ọtụtụ nʼime ha nʼebe ahụ.
JDG 20:44 Ndị agha Benjamin e gburu nʼagha ụbọchị ahụ dị puku iri na asatọ.
JDG 20:45 Mgbe ha chigharịrị na-agbala nʼụzọ ọzara na-aga nʼebe oke nkume Rimọn dị, ndị Izrel gburu puku ndị agha ise nʼime ha nʼụzọ ahụ. Ha chụgidere ndị Benjamin ọsọ ruo Gidom, gbukwaa puku ndị agha ha abụọ.
JDG 20:46 Ya mere, ndị Benjamin e gburu nʼagha nʼụbọchị ahụ dị iri puku abụọ, na ise. Ndị a bụ ndị agha mma agha, dike na dimkpa nʼagha.
JDG 20:47 Naanị narị ndị agha isii nʼime ha tụgharịrị gbapụ ọsọ gbalaga nʼọzara, nʼebe nkume Rimọn dị. Ha nọgidere nʼebe ahụ ọnwa anọ.
JDG 20:48 Mgbe ahụ, ndị agha Izrel hapụrụ ha, laghachi azụ, gaa nʼobodo ndị Benjamin niile gbuo ndị niile nọ nʼime ha, igwe anụ ụlọ, na ihe ndị ọzọ niile dị nʼime ha. Obodo niile ha ruru, ha kpọrọ ha ọkụ.
JDG 21:1 Mgbe ndị ikom Izrel niile zukọtara na Mizpa, ha ṅụrụ iyi sị, “O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ekwe ka nwoke ọbụla si nʼebo Benjamin lụọ ụmụ anyị ndị inyom.”
JDG 21:2 Ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ ebe ahụ ruo mgbede nʼihu Chineke. Ha welitere olu bee akwa dara ụda.
JDG 21:3 “Ha sịrị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel, gịnị mere ihe dị otu a ji dakwasị Izrel? Gịnị mere a ga-eji na-achọ otu ebo Izrel achọ taa?”
JDG 21:4 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri ngwangwa rụọ ebe ịchụ aja. Ha chụrụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼebe ahụ.
JDG 21:5 Emesịa, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-enweghị onye nọchiri anya ha nʼihu Onyenwe anyị anyị mgbe anyị zukọrọ na Mizpa?” Nʼihi na ha ṅụrụ iyi kwuo na onye ọbụla jụrụ ịbịa nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa aghaghị ịnwụ.
JDG 21:6 Ma oke iru ụjụ dị nʼala Izrel dum nʼihi ihe dakwasịrị ụmụnna ha, bụ ndị Benjamin. Ha niile kwuru sị, “Taa, otu ebo Izrel alaala nʼiyi, e kpochapụla ya.
JDG 21:7 Olee otu anyị ga-esi nwetara ndị fọdụrụ nwunye ha ga-alụ ebe anyị ṅụrụ iyi site nʼaha Onyenwe anyị na anyị agaghị enye ha ụmụ anyị ndị inyom?”
JDG 21:8 Mgbe ahụ, ha jụrụ ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-esoghị anyị zukọta mgbe anyị zukọtara nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa?” Ha chọpụtara na o nweghị onye ọbụla si na Jebesh Gilead bịa.
JDG 21:9 Nʼihi na mgbe ha gụrụ ndị zukọrọ ọnụ, ha chọpụtara na o nweghị ndị si Jebesh Gilead bịa.
JDG 21:10 Ya mere, nzukọ ahụ zipụrụ puku ndị agha iri na abụọ, ndị dị ike nʼetiti ha, ka ha gaa jiri mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi na Jebesh Gilead, ndị nwoke, na ndị nwanyị, na ụmụntakịrị.
JDG 21:11 Nke a bụkwa ihe unu ga-eme, “Gbuonụ ndị ikom niile na ụmụ nwanyị niile matarala nwoke.”
JDG 21:12 Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ na-amabeghị nwoke ha chọtara na Jebesh Gilead dị narị anọ. Ndị agha ahụ kpọtara ha na Shaịlo, nʼime Kenan, ebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha.
JDG 21:13 Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ ka ha jekwuru ndị agha Benjamin na nkume Rimọn maka ime udo.
JDG 21:14 Mgbe ndị Benjamin lọghachiri, e dunyere ha narị ndị inyom anọ, ndị Jebesh Gilead, bụ ndị e mere ka ha dị ndụ. Ma ụmụ agbọghọ ndị a ezughị ọnụọgụgụ ha niile.
JDG 21:15 Oge ahụ bụ nnọọ oge iru ụjụ dị ukwuu nʼala Izrel maka ọnọdụ ndị Benjamin, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ka ebo ndị Izrel hapụ izu ezu.
JDG 21:16 Ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme ịlụtara ụmụnna anyị nwunye ebe ọ bụ na ụmụ agbọghọ ndị Benjamin anwụchaala?
JDG 21:17 Ndị Benjamin fọdụrụ ndụ aghaghị inweta ndị ga-anọchi anya ha,” bụ ihe ha kwuru, “ka otu nʼime ebo Izrel ghara ịbụ ndị e kpochapụrụ ekpochapụ.
JDG 21:18 Ma anyị enweghị ike inye ha ndị nwunye site nʼụmụ anyị ndị inyom, nʼihi na ụmụ Izrel ṅụrụ iyi sị, ‘Onye abụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla nke nyere onye Benjamin nwunye.’
JDG 21:19 Ma lee, e nwere mmemme Onyenwe anyị a na-eme afọ niile na Shaịlo, nʼakụkụ ugwu Betel, na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke ụzọ ahụ sitere Betel gaa Shekem, na nʼakụkụ ndịda Lebona.”
JDG 21:20 Ya mere, ha gwara ndị ikom Benjamin, bụ ndị chọrọ nwunye okwu sị ha, “Gaanụ zoo onwe unu nʼubi vaịnị dị nʼagbata ụzọ ahụ,
JDG 21:21 ma na-elepụ anya. Mgbe ụmụ agbọghọ Shaịlo ga-apụta ite egwu ha, sitenụ nʼubi vaịnị gbapụtanụ jide ha, ka onye ọbụla nʼime unu jide otu nwaagbọghọ kpụrụ ya laa nʼala Benjamin, ka ha bụrụ nwunye unu.
JDG 21:22 Ọ bụrụ na nna ha maọbụ ụmụnne ha abịakwute anyị ịjụ ajụjụ banyere ha, anyị ga-agwa ha okwu sị, ‘Biko, gosinụ anyị amara, site nʼịhapụ ha ka ha lụọ ụmụ agbọghọ ahụ, nʼihi na anyị achọtaghị ụmụ agbọghọ ga-ezuru ha niile mgbe anyị gburu ndị niile bi na Jebesh Gilead. O nwekwaghị ụzọ ọzọ unu gaara esi nye ha ụmụ unu ndị nwanyị ghara ịbụ ndị ikpe mara.’ ”
JDG 21:23 Ya mere, ndị Benjamin mere dịka ndụmọdụ e nyere ha si dị. Onye ọbụla nʼime ha jidere otu nwaagbọghọ nʼike mgbe ha na-ete egwu nʼoge mmemme ahụ ka ọ bụrụ nwunye ya. Ha lara nʼihe nketa ha, wughachi obodo ha, biri nʼime ya.
JDG 21:24 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ Izrel laghachiri nʼobodo ha, nʼotu nʼotu, onye ọbụla kwa laghachiri nʼebo ya, nʼikwu ya, nʼihe nketa nke aka ya.
JDG 21:25 Nʼụbọchị ndị a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼihi nke a, onye ọbụla na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ, na ihe ọbụla dị ya mma nʼanya.
RUT 1:1 Nʼoge ndị ahụ, mgbe ndị ikpe na-achị, oke ụnwụ dara nʼala Izrel. Nʼihi ụnwụ a, otu nwoke, onye Betlehem, obodo dị na Juda, kwakọọrọ ihe ya niile, duru nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom abụọ, hapụ obodo ya gaa biri dịka ọbịa nʼala Moab.
RUT 1:2 Aha nwoke a bụ Elimelek. Aha nwunye ya bụ Naomi, ma aha ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ Mahlọn na Kilịọn. Ha bụ ndị Efrat si Betlehem nke dị na Juda. Ha bịarutere nʼala Moab biri nʼebe ahụ.
RUT 1:3 Ma Elimelek di Naomi nwụrụ, hapụ naanị Naomi, na ụmụ ya ndị ikom abụọ.
RUT 1:4 Ha lụrụ ndị nwunye site nʼetiti ndị inyom Moab. Aha nke mbụ bụ Ọpa, ebe aha nke abụọ bụ Rut. Ha biri nʼebe ahụ ihe dị ka afọ iri.
RUT 1:5 Mahlọn na Kilịọn mechara nwụọ. Ya mere, Naomi ghọrọ onye gba aka di, na onye gba aka ụmụ.
RUT 1:6 Mgbe Naomi nọ nʼala Moab nụ na Onyenwe anyị eletala ndị Izrel site nʼinye ha ihe oriri, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ kwadoro ịlaghachi azụ nʼala Izrel.
RUT 1:7 Ya mere, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ hapụrụ ala Moab ebe ha bi kemgbe, malite ịgbaso ụzọ ha ga-esi laghachi nʼala Juda.
RUT 1:8 Mgbe ahụ, Naomi gwara ndị nwunye ụmụ ya abụọ okwu sị ha, “Ngwa, onye ọbụla nʼime unu laghachi nʼụlọ nne ya. Ka Onyenwe anyị gosi unu obiọma dịka unu si gosi mụ onwe m, na ndị unu nwụrụ anwụ.
RUT 1:9 Ka Onyenwe anyị nyekwa unu di ọzọ ma meekwa ka unu chọta udo nʼezinaụlọ ọzọ.” Mgbe ahụ Naomi suturu ha ọnụ, ha niile kwara akwa.
RUT 1:10 Ma Ọpa na Rut zara Naomi sị ya, “E, anyị agaghị ala. Anyị ga-esoro gị laghachikwuru ndị gị.”
RUT 1:11 Naomi zara sị ha, “Laghachinụ ụmụ m, ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ga-eji soro m laa? E nwere m ike ịmụta ụmụ ndị ikom ọzọ ndị ga-abụ di unu?
RUT 1:12 Laghachinụ azụ ụmụ m. Emeela m agadi ịlụ di ọzọ. A sịkwarị na olileanya fọdụụrụ m ịlụ di na ịmụta ụmụ ndị ikom nʼabalị taa,
RUT 1:13 unu ga-echere ruo mgbe ha tolitere? Unu ga-anọ na-alụghị di ọzọ? Mba, ụmụ m ndị inyom, ọnọdụ m dị ilu karịa nke unu, nʼihi na Onyenwe anyị esepụtala aka ya imegide m.”
RUT 1:14 Ha welitere olu ha kwaa akwa ọzọ. Mgbe ahụ Ọpa suturu nne di ya ọnụ ma Rut kwusịrị ike nʼebe ọ nọ.
RUT 1:15 Ma Naomi gwara ya sị, “Lee, nwunye nwanne di gị alaghachikwurula ndị nwe ya na chi ya niile, soro ya laa.”
RUT 1:16 Ma Rut zara, “Akwagidela m ka m hapụ gị, maọbụ ime ka m site nʼiso gị chigharịa. Aga m esoro gị gaa ebe ọbụla ị na-aga. Aga m esokwa gị biri nʼebe ọbụla ị ga-ebi; ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m,
RUT 1:17 ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ebe ahụ kwa ka a ga-eli m. Ka Onyenwe anyị mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ekwere ka ihe ọzọ, ma ọ bụghị ọnwụ, kewaa mụ na gị.”
RUT 1:18 Mgbe Naomi hụrụ na Rut ekpebiela nʼime onwe ya iso ya, ọ kwụsịrị ịgwa ya okwu ọzọ.
RUT 1:19 Ya mere, ha abụọ gagidere ije rute Betlehem. Mgbe ha batara Betlehem, obodo ahụ mere mkpọtụ, nʼihi nlọta ha. Ndị inyom jụrụ sị, “Ọ bụ Naomi bụ nke a nʼezie?”
RUT 1:20 Ma Naomi zara ha sị, “Unu akpọkwala m Naomi, kama kpọọnụ m Mara, nʼihi na Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka ndụ m jupụta nʼihe ilu.
RUT 1:21 Aka m juru eju mgbe m si nʼebe a pụọ, ma Onyenwe anyị emeela ka m gbara aka lọta. Gịnị mere unu ji akpọ m Naomi ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbakụtara m azụ, ebe ọ bụ na Onye pụrụ ime ihe niile mere ka nsogbu dakwasị m.”
RUT 1:22 Otu a ka Naomi na Rut onye Moab bụ nwunye nwa ya si laghachi nʼala Juda. Oge ha ji lọbata nʼobodo Betlehem bụ oge a na-amalite ịghọ ọka balị.
RUT 2:1 Ma Naomi nwere otu nwanne di ya, onye bara ụba, bụrụkwa onye a maara nke ọma, onye si nʼagbụrụ Elimelek. Aha nwoke a bụ Boaz.
RUT 2:2 Rut onye Moab, gwara Naomi okwu sị ya, “Kwere ka m gaa nʼubi ebe a na-aghọ ọka, ka m lee ma m ga-achọta ihuọma nʼihu ndị na-aghọ ọka, ndị ga-ekwere ka m tụtụkọta ọka ndị ha hapụrụ.” Naomi zara sị ya, “Ọ dị mma nwa m, gaa.”
RUT 2:3 Ya mere, Rut pụrụ gaa na-atụtụ ọka nʼazụ ndị na-ewe ihe ubi. Ma dịka ihe si dị, Rut chọpụtara na ubi ọ na-atụtụ ọka bụ ubi Boaz, onye si nʼagbụrụ Elimelek.
RUT 2:4 Nʼoge ahụ, Boaz nʼonwe ya si na Betlehem bịarute nʼubi ahụ, kelee ndị ahụ na-aghọ mkpụrụ nʼubi sị ha, “Onyenwe anyị nọnyere unu.” Ha niile zakwara sị ya, “Onyenwe anyị gọzie gị.”
RUT 2:5 Mgbe Boaz hụrụ Rut, ọ jụrụ onyeisi ndị ọrụ ubi ya sị, “Onye ka nwanyị a bụ?”
RUT 2:6 Onye nlekọta ọrụ ubi ahụ zaghachiri, “Ọ bụ onye Moab ahụ so Naomi lọta.
RUT 2:7 Ọ sịrị, ‘Biko kwere ka m soro ndị ọrụ nʼazụ tụtụkọtaa ukwu ọka ha hapụrụ.’ Kemgbe ụtụtụ ọ bịara, ọ kwụsịbeghị ọrụ ya karịakwa naanị nwa mgbe nta o zuru ike nʼokpuru ndo.”
RUT 2:8 Ya mere, Boaz gwara Rut okwu sị ya, “Nwa m nwanyị, gee m ntị. Agakwala ịtụtụ ọka nʼubi ọzọ, esitekwala nʼebe a pụọ. Soro ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi nọdụ nʼebe a.
RUT 2:9 Lezie anya nʼubi ebe ndị ikom na-ewe ihe ubi, ma soro ụmụ agbọghọ ndị a. Enyela m ndị ikom ndị a iwu ka ha ghara ịmetụ gị aka. Mgbe ọbụla agụụ mmiri gụrụ gị, gaa nʼite mmiri ndị ahụ ndị ikom gbanyere mmiri kuru mmiri ṅụọ.”
RUT 2:10 Mgbe Boaz na-agwa ya okwu, Rut hulatara isi ya ala. Emesịa o kwuru sị, “Gịnị mere m ji chọta ụdị amara dị otu a nʼebe ị nọ, na ị hụtara m, ebe ị maara na m bụ naanị onye mba ọzọ?”
RUT 2:11 Boaz zara sị ya, “Anụla m ihe niile i meere nne di gị site nʼoge di gị nwụrụ, na otu i si hapụ nne gị na nna gị, na ala ebe amụrụ gị, bịa nʼebe a ibi nʼetiti ndị ị na-amaghị na mbụ.
RUT 2:12 Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ụgwọ ihe ọma ndị a i mere. Ka Onyenwe anyị onye bụ Chineke Izrel, onye ị gbabara nʼokpuru nku ya izere ndụ kwụghachi gị nkwụghachi dị ukwu nʼihi ezi ọrụ gị niile.”
RUT 2:13 Rut zara sị ya, “Ka m gaa nʼihu na-achọta amara nʼebe ị nọ, onyenwe m. Nʼihi na ị kasịela m obi, gwakwa m, odibo nwanyị gị, okwu dị nro. Ọ bụ ezie na m abụghị otu nʼime ndị odibo nwanyị gị.”
RUT 2:14 Mgbe oge iri nri ruru, Boaz sịrị ya, “Bịa nso nʼebe a, were ụfọdụ nri rie, sunyekwa achịcha gị nʼime mmanya viniga.” Mgbe o soro ndị ahụ na-ewe ihe ubi nọdụ ala iri ihe, o nyere ya ụfọdụ ọka a hụrụ nʼọkụ. O riri, rijuo afọ ma nri e nyere ya fọdụrụ.
RUT 2:15 Mgbe o biliri ịchịkọtakwa ọka, Boaz nyere ụmụ okorobịa ya iwu, “Hapụnụ ya ka ọ chịkọta ọka ọ bụladị nʼetiti ukwu ọka ndị guzo eguzo, unu agwala ya okwu ihere ọbụla.
RUT 2:16 Unu sitekwa nʼukwu ọka mịpụtara ya ụfọdụ tụsara ya nʼala ka ọ tụtụrụ. Unu abarala ya mba.”
RUT 2:17 Ya mere, Rut tụtụrụ ọka nʼubi ahụ ruo oge anyasị. Mgbe ọ fuchasịrị ọka balị niile ọ tụtụtara, o nwetara ihe nwere ike iru otu bushel.
RUT 2:18 O buuru ya baa nʼime obodo, bunye ya nne di ya, nyekwa ya nri o rifọrọ mgbe o rijuchara afọ.
RUT 2:19 Nne di ya jụrụ ya, “Ebee ka ị tụtụrụ ọka taa? Ebee ka ị rụrụ ọrụ? Ka nwoke ahụ hụtara gị bụrụ onye a gọziri agọzi.” Rut kọọrọ nne di ya banyere onye ahụ ọ rụrụ ọrụ na nke ya. Ọ sịrị, “Aha nwoke mụ na ya rụrụ ọrụ bụ Boaz.”
RUT 2:20 Mgbe ahụ Naomi zara nwunye nwa ya sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri ka ọ bụ, onye na-ahapụbeghị igosi ebere ya nye ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Nwoke a bụ otu nʼime ndị agbụrụ anyị, otu onye nʼime ndị onye mgbapụta anyị.”
RUT 2:21 Mgbe ahụ Rut, onye Moab sịrị, “Ihe ọ sịkwara m bụ, ‘Nọnyere ndị ọrụ m tutu ruo mgbe ha ghọchara ọka niile dị nʼubi m.’ ”
RUT 2:22 Naomi sịrị Rut, nwunye nwa ya, “Nwa m nwanyị, ọ kaara gị mma ime dịka o kwuru. Soro ụmụ agbọghọ nọ nʼubi ya nʼazụ tụtụọ ọka ị na-atụtụ, nʼihi na nʼubi onye ọzọ, e nwere ike imerụ gị ahụ.”
RUT 2:23 Ya mere, Rut sogidere ụmụ agbọghọ Boaz na-atụtụ ọka, tutu ruo ọgwụgwụ ịghọ ọka balị na wiiti. Ya na nne di ya bigidekwara.
RUT 3:1 Otu ụbọchị, Naomi, nne di Rut, gwara ya okwu sị, “Nwa m nwanyị, ọ bụ na o rubeghị mgbe m ga-achọtara gị ụlọ nke aka gị, ebe a ga-anọ lekọtazie gị anya nke ọma?
RUT 3:2 Ọ bụ na Boaz, onye gị na ụmụ agbọghọ ya so rụọ ọrụ ịchịkọta ọka abụghị onye agbụrụ anyị? Lee, nʼabalị taa ka ọ ga-afụcha ọka balị nʼebe ịzọcha ọka.
RUT 3:3 Ugbu a, gaa saa ahụ gị, teekwa mmanụ isi ụtọ, yirikwa uwe mara mma. I mesịa, gaa nʼebe ịzọcha ọka, ma ekwekwala ka ọ hụ gị, tutu ruo mgbe o risiri nri ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ.
RUT 3:4 Leziekwa anya chọpụta ebe ọ ga-edina rahụ ụra. Mgbe ị maara na ọ rahụla ụra nke ọma, gaa kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya, dinaakwa ala nʼebe ahụ. Ọ ga-agwa gị ihe ị ga-eme.”
RUT 3:5 Rut zara sị, “Aga m eme ihe ọbụla ị sị m mee.”
RUT 3:6 Ya mere, Rut pụrụ nʼabalị ahụ gaa nʼebe ịzọcha ọka ahụ, meekwa dịka nne di ya gwara ya.
RUT 3:7 Mgbe Boaz risiri nri ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mmụọ ya dịkwa mma, ọ gara ka ọ dinaa ala na nsọtụ ebe atụkọtara akpa ọka. Rut jiri nwayọọ gaa nʼebe ahụ, kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ, dina nʼakụkụ ụkwụ ya.
RUT 3:8 Nʼetiti abalị Boaz kụjara teta na mberede, tụgharịa, ma lee o nwere nwanyị dina nʼala ala ụkwụ ya.
RUT 3:9 Ọ jụrụ ya sị, “Ị bụ onye?” Rut zara ya sị, “Abụ m Rut, ohu gị nwanyị, onyenwe m. Were ọnụ ọnụ akwa gị kpukwasị m, nʼihi na ị bụ onye agbụrụ mgbapụta m dị nso.”
RUT 3:10 Boaz zara sị ya, “Onyenwe anyị gọzie gị, nwa m nwanyị. Ịhụnanya i gosiri ugbu a akarịala nke i gosiri na mbụ, nʼihi na i gbasoghị ụmụ okorobịa, ma ha bụ ọgaranya maọbụ ogbenye.
RUT 3:11 Ma ugbu a, nwa m nwanyị, atụla ụjọ. Aga m emezuru gị dịka i si rịọọ, nʼihi na mmadụ niile maara na ị bụ onye nwere ezi agwa.
RUT 3:12 Ọ bụ ezie na m bụ onye mgbapụta dị nso nke ezinaụlọ anyị, ma o nwere onye ọzọ dị ezi nso karịa m.
RUT 3:13 Nọdụ nʼebe a nʼabalị a. Nʼụtụtụ, ọ bụrụ na onye ahụ ekwere imezu ọrụ ya dịka onye mgbapụta, ya rụzuo ya. Ọ bụrụ na o kwere, ọ dị mma, ọ bụrụkwanụ na o kweghị, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m emezu ya. Ugbu a, dinara ala ruo ụtụtụ.”
RUT 3:14 Ya mere, Rut dinara nʼụkwụ ya ruo ụtụtụ. Ma chi abọzibeghị nke ọma mgbe o si nʼebe ahụ bilie nʼihi na Boaz sịrị ya, “Ekwela ka onye ọbụla mata na nwanyị bịara nʼebe ịzọcha ọka.”
RUT 3:15 O gwakwara Rut okwu sị ya, “Chịta akwa mgbokwasị gị, gbasaa ya.” Ya mere Rut gbasara akwa ya, Boaz manyere ya ọtụtụ ọka balị isii, bokwasị ya Rut, onye buuru ya banye nʼime obodo.
RUT 3:16 Mgbe Rut bịakwutere nne di ya, Naomi jụrụ ya sị, “Nwa m nwanyị, olee otu ihe si gaa?” Rut gwara ya ihe niile Boaz meere ya, sị,
RUT 3:17 “Ọ manyeere m ọtụtụ ọka balị isii ndị a si m, ‘O kwesighị ka ị gbara aka lakwuru nne di gị.’ ”
RUT 3:18 Naomi zara si ya, “Chere, nwa m nwanyị, ruo mgbe ị ga-ahụ otu okwu a ga-esi bie. Nwoke a agaghị ezu ike tutu ruo mgbe o kwubiri okwu a taa.”
RUT 4:1 Ya mere, Boaz pụrụ gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ, nọdụ ala nʼebe ahụ. Ọ dịghị anya onye mgbapụta ahụ dị nso nke Boaz kwuru okwu banyere ya si nʼebe ahụ na-agafe. Boaz kpọrọ ya sị, “Enyi m bịa nọdụ ala.” Ọ bịara nọdụ ala.
RUT 4:2 Boaz kpọrọ mmadụ iri, ndị bụ ndị okenye obodo ahụ, gwa ha, “Nọdụnụ ala nʼebe a.” Ha mere otu ahụ.
RUT 4:3 Mgbe ahụ, ọ gwara nwoke onye mgbapụta ahụ dị nso sị, “Naomi, onye si nʼala ndị Moab lọta, na-achọ ire ala nwanna anyị nwoke Elimelek.
RUT 4:4 Ahụrụ m na o kwesiri ka m buru ụzọ gwa gị ka ị zụọ ya nʼihu ndị a nọ ọdụ nʼebe a, na nʼihu ndị okenye obodo anyị. Ọ bụrụ na ị ga-agbara ya, gwa m, ọ bụrụkwanụ na ị gaghị agbara ya, gwa m, ka m mara ihe m ga-eme. Nʼihi na ọ bụ gị ka ọ dịrị ịgbapụta ya. Mụ onwe m na-esote gị.” Ọ zara sị, “Aga m agbapụta ya.”
RUT 4:5 Mgbe ahụ, Boaz sịrị, “Nʼụbọchị ị ga-azụrụ ala ahụ site nʼaka Naomi ka ị ga-enwetakwa Rut onye Moab bụ nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ, ime ka aha onye ahụ nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide.”
RUT 4:6 Na nke a, onye nchekwa mgbapụta ahụ sịrị, “Apụghị m ịgbapụta ya nʼihi na e nwere m ike itinye ihe nketa m na nsogbu. Gị onwe gị gbapụta ya. Nke a agaghị ekwe m omume.”
RUT 4:7 Na mgbe ochie nʼala Izrel, ime ka mgbapụta ihe na iwefe ihe site nʼaka baa nʼaka zuo oke, otu onye ga-eyipụ akpụkpọụkwụ ya were ya nye onye nke ọzọ. Otu a ka e si ekpebi okwu gbasara orire na ọzụzụ, na-ime ka ihe ndị ọzọ guzosie ike nʼala Izrel.
RUT 4:8 Nʼihi ya, mgbe nwoke ahụ gwara Boaz sị ya, “Zụrụ ala ahụ nʼonwe gị,” o yipụtara akpụkpọụkwụ ya.
RUT 4:9 Mgbe ahụ, Boaz kwupụtara na ntị ndị okenye ndị ahụ na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Unu bụ ndị akaebe na esitela m nʼaka Naomi zụrụ ala niile Elimelek, na Kilịọn na Mahlọn nwere.
RUT 4:10 Azụrụkwala m Rut onye Moab, nwunye Mahlọn ka ọ bụrụ nwunye m, ime ka aha onye nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide, ka aha ha hapụ ifu nʼetiti ndị ikwu ya maọbụ site nʼobodo ebe amụrụ ya. Taa unu niile bụ ndị akaebe m.”
RUT 4:11 Mgbe ahụ, ndị okenye na ndị niile nọ nʼọnụ ụzọ ama kwuru sị, “Anyị bụ ndị akaebe. Ka Onyenwe anyị mee nwanyị a na-abata nʼezinaụlọ gị ka ọ dịrị ka Rechel na Lịa, ndị ebo Izrel niile sitere na ha pụta! Ka ị bụrụkwa ọgaranya nʼagbụrụ Efrata, ghọọkwa onye a ma ama na Betlehem.
RUT 4:12 Site nʼụmụ Onyenwe anyị ga-enye gị site na nwanyị a, ka ezinaụlọ gị dịrị ka nke Perez onye Tama mụụrụ Juda.”
RUT 4:13 Boaz kpọọrọ Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe ya na Rut dinakọrọ, Onyenwe anyị nyeere ya aka ịtụrụ ime. Ọ mụkwara nwa nwoke.
RUT 4:14 Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile.
RUT 4:15 Ya wetakwara gị ntute na ndụ gị ma bụrụkwa onye ga-azụ gị nʼisi awọ gị. Nʼihi na nwunye nwa gị, onye hụrụ gị nʼanya, onye baara gị uru karịa ndị ikom asaa, amụọrala gị nwa nwoke.”
RUT 4:16 Naomi kuuru nwantakịrị ahụ, jikụọ ya nʼapata ya, lekọtaa ya.
RUT 4:17 Ndị inyom ndị agbataobi ya sịrị, “Ugbu a, nʼikpeazụ, Naomi enwetala nwa nwoke ọzọ!” Ha gụrụ ya Obed. Ọ bụkwa onye ahụ bụ nna Jesi, onye bụ nna Devid.
RUT 4:18 Nke a bụ usoro ndị a mụrụ site na Perez. Perez mụrụ Hezrọn
RUT 4:19 Hezrọn mụrụ Ram Ram mụrụ Aminadab
RUT 4:20 Aminadab mụrụ Nashọn Nashọn mụrụ Salmọn
RUT 4:21 Salmọn mụrụ Boaz Boaz mụrụ Obed
RUT 4:22 Obed mụrụ Jesi Jesi mụrụ Devid.
1SA 1:1 O nwere otu nwoke onye Zuf, si na Ramataim, nʼala ugwu ugwu Ifrem. Aha ya bụ Elkena nwa Jeroham, nwa Elihu, nwa Tohu, nwa Zuf, onye Ifrem.
1SA 1:2 Elkena lụrụ ndị inyom abụọ, aha nke mbụ bụ Hana, ebe aha nke abụọ bụ Penina. Penina nwere ụmụ, ma Hana enweghị nwa.
1SA 1:3 Kwa afọ, nwoke a na-esi nʼobodo ya gaa Shaịlo ife ofufe na ịchụrụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aja. Ọ bụ nʼebe ahụ ka ụmụ ndị ikom abụọ Elayị a na-akpọ Hofni na Finehaz, bụ ndị nchụaja Onyenwe anyị nọ.
1SA 1:4 Nʼụbọchị ọbụla Elkena na-achụ aja ya, ọ na-ekenye Penina na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom ọtụtụ oke site nʼanụ o ji chụọ aja.
1SA 1:5 Ma ọ na-enye Hana oke mmadụ abụọ, nʼihi na ọ hụrụ ya nʼanya, ọ bụ ezie na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.
1SA 1:6 Ma Penina na-eme ka obi jọọ Hana njọ karịa, site nʼikpasu ya iwe, nʼihi na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.
1SA 1:7 Ihe ndị a na-eme kwa afọ. Penina na-akwa Hana emo, na-achị ya ọchị oge niile ha gara nʼụlọ Onyenwe anyị, si otu a na-eme ka ọ na-akwa akwa, gharakwa iri nri.
1SA 1:8 Mgbe Hana bidoro ịkwa akwa otu a, Elkena na-ajụ ya sị, “Hana, ọ bụ gịnị mere i ji na-akwa akwa? Gịnị mere ị naghị eri nri? Gịnị mere obi ji ajọ gị njọ? Ọ bụ na mụ adịghị gị mma karịa ụmụ ndị ikom iri nye gị?”
1SA 1:9 Otu ụbọchị mgbe ha risiri nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ na Shaịlo, Hana biliri ọtọ. Nʼoge a, Elayị onye nchụaja nọdụrụ ala nʼoche ya nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ Onyenwe anyị.
1SA 1:10 Nʼọnọdụ obi mwute Hana kwara akwa, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị.
1SA 1:11 O kwere nkwa sị, “O! Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụrụ na ị ga-elekwasị anya na nhụju anya nke ohu gị nwanyị ma cheta m, ghara ichefu ohu gị nwanyị, ma nye ya nwa nwoke, mgbe ahụ, aga m enyeghachi ya Onyenwe anyị ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Agụba agakwaghị aga nʼisi ya mgbe ọbụla.”
1SA 1:12 Mgbe ọ nọgidere na-ekpe ekpere nye Onyenwe anyị, Elayị nọ na-ele ya anya nʼọnụ.
1SA 1:13 Ka Hana nọ na-ekpe ekpere nʼobi ya, naanị egbugbere ọnụ ya na-emegharị emegharị, ma enweghị onye na-anụ olu ya. Mgbe ahụ, Elayị chere nʼobi ya na ọ bụ nwanyị mmanya na-egbu.
1SA 1:14 Elayị sịrị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-akwụsị ịṅụbiga mmanya oke? Si nʼebe mmanya dị wezuga onwe gị!”
1SA 1:15 Ma Hana zara sị ya, “Mba, onyenwe m, aṅụghị m mmanya ọbụla! Kama abụ m nwanyị obi ya dị ilu nke ukwuu. Anọ m na-ekwupụtara Onyenwe anyị ihe dị m nʼobi.
1SA 1:16 Biko agụla ohu gị nwanyị dịka onye ajọ omume. Esi m nʼobi mwute na-akwasara Onyenwe anyị ụwa m.”
1SA 1:17 Elayị zara sị ya, “Laa nʼudo, ka Chineke Izrel mezuoro gị dịka arịrịọ gị niile si dị.”
1SA 1:18 Hana zara sị, “Ka m bụrụ onye si nʼaka gị nata ihuọma.” O jiri obi ụtọ laghachi, malitekwa iri nri ya. Ihu ya agbarụkwaghị ọzọ.
1SA 1:19 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri kpọọ isiala nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, ha laghachiri nʼụlọ ha dị na Rema. Mgbe ha laruru, Elkena bakwuru nwunye ya Hana, Onyenwe anyị chetakwara ya.
1SA 1:20 Mgbe oge ruru, o mere ka Hana tụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ gụrụ ya Samuel, nʼihi na ọ sịrị, “Arịrịọ m Onyenwe anyị maka ya.”
1SA 1:21 Mgbe di ya, bụ Elkena na ndị ezinaụlọ ya gara Shaịlo ịchụrụ Onyenwe anyị aja nke afọ ahụ, na ịchụkwa aja metụtara nkwa dị iche nke o kwere Onyenwe anyị,
1SA 1:22 Hana esoghị ha, ọ gwara di ya, “Mgbe nwantakịrị a kwụsịrị ịṅụ ara, ka m duru ya ga chee ya nʼihu Onyenwe anyị, ọ ga-ebikwa nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi.”
1SA 1:23 Elkena bụ di ya sịrị ya, “Mee ihe ọbụla i chere kwesiri ekwesi. Nọdụ ruo mgbe ọ hapụrụ ịṅụ ara, ma ka Onyenwe anyị mezuo okwu ya.” Hana nọgidere nʼụlọ tutu ruo mgbe ọ zụlitere nwantakịrị ahụ, kwụsị ya ịṅụ ara.
1SA 1:24 Mgbe ọ kwụsịrị nwantakịrị ahụ ịṅụ ara, nwantakịrị ahụ ka dị ntakịrị. Ma o duuru ya, jiri oke ehi gbara afọ atọ, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu karama mmanya, gaa nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Shaịlo.
1SA 1:25 Mgbe ha ji oke ehi ahụ chụsịa aja, ha kpọtaara Elayị nwantakịrị ahụ.
1SA 1:26 Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Onyenwe m, dịka ị si na-adị ndụ, ọ bụ m bụ nwanyị ahụ guzoro onwe ya nso nʼebe ị nọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị.
1SA 1:27 Nʼihi nwa a ka m kpere ekpere, Onyenwe anyị emelara m ihe m rịọrọ nʼaka ya.
1SA 1:28 Ma ugbu a, ana m enyeghachi ya Onyenwe anyị ka ọ bụrụ nke ya ndụ ya niile.” O fere Onyenwe anyị ofufe nʼebe ahụ.
1SA 2:1 Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị: “Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị; nʼime Onyenwe anyị ka e buliri mpi m elu. Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m, nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị.
1SA 2:2 “O nweghị onye dị nsọ dịka Onyenwe anyị; o nweghị onye dị karịa gị, o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị.
1SA 2:3 “Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako, ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile, ya bụ onye na-anwale ọrụ niile.
1SA 2:4 “Ụta ndị na-ebu agha agbajiela ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike.
1SA 2:5 Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri, ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa. Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa.
1SA 2:6 “Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ.
1SA 2:7 Onyenwe anyị na-ezite ụbịam na akụnụba; ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu.
1SA 2:8 Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ. Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ, na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ. “Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa.
1SA 2:9 Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị. “Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa.
1SA 2:10 Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa. Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha. Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe. “Ọ ga-enye eze ya ike bulikwaa ịdị ike nke onye ya e tere mmanụ.”
1SA 2:11 Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka.
1SA 2:12 Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị Onyenwe anyị anya.
1SA 2:13 Dịka mmeso ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ si dị: mgbe onye ọbụla bịara ịchụ aja, onyeozi onye nchụaja na-abịa mgbe a na-esi anụ, jiri ndụdụ nwere eze atọ nʼaka ya.
1SA 2:14 Ọ na-adụnye ya nʼime efere anụ maọbụ ite, maọbụ iko e ji esi anụ. Ihe ọbụla ndụdụ ahụ dụpụtara ka onye nchụaja na-ewere. Otu a ka ha si emeso ndị Izrel niile na-abịa na Shaịlo.
1SA 2:15 Mgbe ụfọdụ, tupu e suree abụba anụ nʼebe ịchụ aja, ndị ozi onye nchụaja na-abịa gwa onye wetara anụ ịchụ aja sị ya, “Nye onye nchụaja anụ ndụ nke ọ ga-ahụ nʼọkụ, nʼihi na ọ chọghị iri anụ e siri esi, kama anụ ndụ ka ọ chọrọ.”
1SA 2:16 Ọ bụrụ na onye ji anụ ahụ bịa ịchụ aja agwa onyeozi ahụ okwu sị, “Chere ka anyị buru ụzọ suo abụba ndị a ọkụ tupu i were ihe ị chọrọ,” onyeozi ahụ na-aza sị, “Nye m anụ ahụ ugbu a, ọ bụrụ na i nyeghị m ya aga m eji ike were ya.”
1SA 2:17 Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị anya.
1SA 2:18 Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja.
1SA 2:19 Afọ ọbụla, nne ya na-akwara ya uwe mwụda, nke ọ na-ewetara ya mgbe ya na di ya bịara ịchụ aja.
1SA 2:20 Tupu ha alaa, Elayị na-agọzi Elkena na Hana sị, “Ka Onyenwe anyị nye gị ụmụ ọzọ, ndị ga-anọchi anya onye a ị rịọrọ maka ya, nke i nyeghachiri Onyenwe anyị.”
1SA 2:21 Onyenwe anyị gosiri Hana amara. Ọ tụrụ ime mụta ụmụ ndị ikom atọ, na ụmụ ndị inyom abụọ. Ma Samuel tokwara nʼije ozi ya nʼihu Onyenwe anyị.
1SA 2:22 Nʼoge a, Elayị abụrụla nnọọ agadi. Ọ nọkwa na-anụ ihe ọjọọ niile ụmụ ya ndị ikom na-eme ndị Izrel niile, ya na otu ha si edinakwuru ụmụ nwanyị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ebe ịchụ aja ụlọ nzute.
1SA 2:23 Ya mere, Elayị gwara ụmụ ya sị, “Anụla m site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị, banyere ihe ọjọọ niile dị iche iche unu na-eme. Gịnị mere unu ji na-eme ihe ọjọọ dị otu a?
1SA 2:24 Ọ bụghị akụkọ ọma ka m na-anụ site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị banyere unu.
1SA 2:25 Ọ bụrụ na mmadụ emehie megide mmadụ, Chineke nwere ike gbooro ya ọgụ. Ma ọ bụrụ na mmadụ emehie megide Onyenwe anyị, onye ga-egboro ya ọgụ?” Ma ụmụ ya ndị ikom egeghị nna ha ntị, nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ịla ha nʼiyi.
1SA 2:26 Nwata ahụ bụ Samuel na-eto, na-agba dimkpa, bụrụkwa onye ihe ya dị Onyenwe anyị na mmadụ mma.
1SA 2:27 Otu onye nke Chineke bịara gwa Elayị okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ na m ezipụtaghị ike m nʼụzọ pụtara ihe mgbe nna nna gị ha bụ ohu nʼala Ijipt nʼokpuru Fero?
1SA 2:28 Ahọpụtara m nna nna unu ochie site nʼetiti ebo niile nke Izrel mee ya ka ọ bụrụ onye nchụaja m, ka ọ chụọ aja nʼebe ịchụ aja m, isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na iyi uwe efọọd ndị nchụaja nʼihu m. Enyere m ezinaụlọ nna nna gị onyinye niile Izrel ji chụọ aja nsure ọkụ.
1SA 2:29 Gịnị mere unu ji na-elelị aja a na-achụrụ m, na onyinye a na-ewetara m nʼusoro dịka m si nye ya nʼiwu anya? Gịnị mere i ji na-asọpụrụ ụmụ gị karịa m, ime onwe unu ka unu gbaa abụba site nʼidebere onwe unu akụkụ kachasị mma nke onyinye niile ụmụ Izrel, ndị m, na-ewetara m.
1SA 2:30 “Nʼihi ya, otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, kwupụtara, sị, ‘Ekwere m nkwa na ndị ezinaụlọ gị na nke nna gị ga-eje ozi nʼihu m ruo mgbe ebighị ebi,’ ma ugbu a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, ‘Ọ gaghị adịkwa otu a nʼebe m nọ! Nʼihi na ndị na-asọpụrụ m ka m ga-asọpụrụ, ma ndị niile na-eleda m anya, ka a ga-akpọ ihe efu.
1SA 2:31 Oge na-abịa mgbe m ga-ebipụ ike gị na ike ezinaụlọ nna gị, wezuga ha ka nwoke ọbụla nʼezinaụlọ gị hapụ ito ghọọ agadi.
1SA 2:32 Ị ga-ahụ mkpagbu nʼebe obibi m; a ga-emere Izrel ihe ọma nke ga-eme ka i nwee anya ụfụ, ma ọ dịghị onye ga-eme agadi nʼezinaụlọ gị.
1SA 2:33 Onye ọbụla nʼime unu nke m na-ebipụghị site nʼebe ịchụ aja m ga-adị ndụ naanị nʼọnọdụ anya mmiri akwa nke ga-ekpuchi ya anya, na iru ụjụ nke obi. Ụmụ ụmụ gị niile ga-anwụ tupu ha eruo agadi.
1SA 2:34 “ ‘Ihe ga-adakwasị ụmụ gị ndị ikom, bụ Hofni na Finehaz, ga-abụrụ gị ihe ama. Ha abụọ ga-anwụ nʼotu ụbọchị.
1SA 2:35 Aga m akpọlite nye onwe m, onye nchụaja kwesiri ntụkwasị obi, onye ga-eme ihe dị m nʼuche na nʼobi. Aga m eme ka ezinaụlọ ya guzosie ike. O ga-eje ozi nʼihu Onye m e tere mmanụ oge niile.
1SA 2:36 Mgbe ahụ, ndị niile fọdụrụ nʼezinaụlọ gị ga-abịa kpọọ isiala nye ya, rịọọ ya ego na ihe oriri. Ha ga-asị, “Biko, nyetụ m ọrụ m ga-arụ nʼetiti ndị nchụaja, ka m hụ ihe m ga-eri.” ’ ”
1SA 3:1 Nwata ahụ bụ Samuel nọkwa na-ejere Onyenwe anyị ozi nʼihu Elayị. Nʼụbọchị ndị ahụ okwu Onyenwe anyị dị ụkọ, adịghịkwa ahụ ọtụtụ ọhụ.
1SA 3:2 O ruru nʼotu abalị, ka Elayị dinara ala nʼọnọdụ ya ịrahụ ụra, ebe ọ bụ na anya ya akala nka nke bụ na ọ dịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma.
1SA 3:3 Mgbe ahụ, oriọna Chineke anyụbeghị, Samuel dinara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼebe ahụkwa ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị.
1SA 3:4 Onyenwe anyị kpọrọ Samuel oku, Samuel zara sị, “Lee m nʼebe a.”
1SA 3:5 O biliri jekwuru Elayị, sị ya, “Lee m abịala m.” Ma Elayị sịrị ya, “Mba, akpọghị m gị, laghachi gaa dinaa ala.” Samuel gara dina ala.
1SA 3:6 Ọzọkwa, Onyenwe anyị kpọrọ ya sị, “Samuel!” Samuel gbaara ọsọ jekwuru Elayị sị ya, “Lee m, gịnị ka m ga-eme?” Ma Elayị zara sị ya. “Mba akpọghị m gị oku, nwa m. Laghachi gaa dinaa ala.”
1SA 3:7 Ma Samuel amatabeghị onye Onyenwe anyị bụ, ekpughebeghị okwu Onyenwe anyị nye ya.
1SA 3:8 Onyenwe anyị kpọrọ ya oku nke ugbo atọ; ọzọkwa Samuel biliri jekwuru Elayị sị ya, “Lee m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?” Mgbe ahụ, Elayị ghọtara na ọ bụ Onyenwe anyị na-akpọ nwantakịrị ahụ,
1SA 3:9 nʼihi ya ọ gwara Samuel okwu sị, “Laghachi, dinaa ala. Ọ bụrụ na ọ kpọọ gị ọzọ, sị ya, ‘Lee m, kwuo, Onyenwe anyị, nʼihi na ohu gị na-ege ntị.’ ” Ya mere Samuel laghachiri gaa dinaa ala.
1SA 3:10 Onyenwe anyị bịara guzo onwe ya nʼebe ahụ, kpọọ ya ọzọ dịka o si kpọọ ya na mbụ sị, “Samuel! Samuel!” Samuel zara sị, “Lee m, kwuo, nʼihi na ohu gị na-anụ.”
1SA 3:11 Onyenwe anyị gwara Samuel sị, “Lee, ana m aga ime ihe nʼIzrel nke ga-eme ka ntị nụrụ ya zụọ wuruwuru.
1SA 3:12 Nʼoge ahụ aga m emezu ihe niile m kwuru megide Elayị na ezinaụlọ ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ.
1SA 3:13 Nʼihi na agwara m ya na m ga-ekpe ezinaụlọ ya ikpe, ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi mmehie ahụ ọ maara ihe banyere ya. Nʼihi na ụmụ ya mere onwe ha ndị a na-elelị anya, ma o meghị ihe ọbụla ịkwụsị ha.
1SA 3:14 Ya mere, aṅụọla m iyi nye ụlọ Elayị sị, ‘Ikpe ọmụma dịkwasịrị ụlọ Elayị bụ nke a na-agaghị eji onyinye maọbụ ịchụ aja kpuchie.’ ”
1SA 3:15 Samuel dinara ala tutu ruo ụtụtụ. Mgbe chi bọrọ, o meghere ọnụ ụzọ ụlọ nzute Onyenwe anyị dịka ọ na-eme. Ma egwu tụrụ ya ịgwa Elayị ọhụ ahụ.
1SA 3:16 Ma Elayị kpọrọ ya sị, “Samuel, nwa m.” Samuel zara sị, “Lee m nʼebe a.”
1SA 3:17 Elayị jụrụ ya sị, “Gịnị ka ọ gwara gị? Ezola ihe ọbụla nʼebe m nọ. Ka Chineke mesoo gị mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na i zoo ihe ọbụla ọ gwara gị nʼebe m nọ.”
1SA 3:18 Ya mere, Samuel gwara ya ihe niile, o zokwaghị ihe ọbụla. Mgbe ahụ Elayị kwuru okwu sị, “Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị, ya meekwa dịka o si dị ya mma nʼanya.”
1SA 3:19 Onyenwe anyị nọnyeere Samuel mgbe ọ na-eto, meekwa ka amụma niile Samuel buru mezuo.
1SA 3:20 Ndị Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, matara na Samuel bụ onye amụma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi.
1SA 3:21 Onyenwe anyị gakwara nʼihu na-egosi onwe ya na Shaịlo. Nʼebe ahụ o gosiri onwe ya nye Samuel site nʼokwu ya.
1SA 4:1 Okwu Samuel rutere ndị Izrel niile ntị. Mgbe Izrel pụrụ izute ndị Filistia nʼagha, ha mara ụlọ ikwu ha na Ebeneza, ma ndị Filistia mara nke ha nʼAfek.
1SA 4:2 Nʼagha a lụrụ nʼụbọchị ahụ, ndị Filistia doro onwe ha nʼusoro izute ndị Izrel, dịka agha na-agbasa, ndị Filistia lụgburu ụmụ Izrel, gbukwaa puku mmadụ anọ nʼime ha.
1SA 4:3 Mgbe ndị agha Izrel fọdụrụ laghachiri nʼụlọ ikwu ha, ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị mere Onyenwe anyị ji kwe ka ndị Filistia merie anyị taa. Ka anyị gaa Shaịlo buputa igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ka o soro anyị jee agha, ka ọ napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị.”
1SA 4:4 Ya mere, ha zigara ndị mmadụ ka ha gaa Shaịlo. Ha sitere nʼebe ahụ bute igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye ahụ na-anọkwasị nʼoche ebere nʼetiti cherubim. Ụmụ ndị ikom Elayị abụọ, bụ Hofni na Finehaz, nọnyeere igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ.
1SA 4:5 Mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼebe ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha, ndị Izrel tiri mkpu mere ka ala maa jijiji.
1SA 4:6 Mgbe ndị Filistia nụrụ ụda mkpu a, ha jụrụ sị, “Gịnị na-eme? Ọ bụ gịnị kpatara oke iti mkpu a nʼụlọ ikwu ndị Hibru?” Mgbe a gwara ha na ọ bụ nʼihi na igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị erutela,
1SA 4:7 ụjọ tụrụ ndị Filistia. Ha sịrị, “Chi abatala nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na ihe dị otu a emetụbeghị nʼoge gara aga.
1SA 4:8 Ahụhụ dịrị anyị! Onye ga-anapụta anyị site nʼaka chi ndị a dị ike? Nʼihi na ọ bụ chi ndị a ji ihe otiti dị iche iche tie ndị Ijipt mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara.
1SA 4:9 Unu dị ike, unu ndị Filistia, bụrụkwanụ ndị ikom, ma ọ bụghị otu a, unu ga-aghọ ohu ndị Hibru dịka ha bụụrụ unu ndị ohu. Bụrụnụ ndị ikom, lụọ agha!”
1SA 4:10 Ndị Filistia lụrụ ọgụ dịka dike, lụgbuo ndị Izrel. Ndị agha ji ụkwụ eje ọgụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ. Ma ndị fọdụrụ gbalara nʼụlọ ikwu ha.
1SA 4:11 Ndị Filistia dọtara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼagha, ma gbukwaa Hofni na Finehaz ụmụ Elayị.
1SA 4:12 Ma otu nwoke onye Benjamin gbapụrụ ọsọ site nʼọgbọ agha ahụ, gbara ruo Shaịlo nʼotu ụbọchị ahụ, o yi uwe dọwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi.
1SA 4:13 Mgbe o rutere, Elayị nọ nʼoche ya nʼakụkụ ụzọ, na-eche, nʼihi na obi ya na-ama jijiji, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Mgbe nwoke ahụ batara nʼime obodo, kọọ ihe mere, mkpu akwa dara nʼobodo ahụ niile.
1SA 4:14 Elayị nụrụ iti mkpu ahụ jụọ sị, “Gịnị bụ isi ụzụ a?” Onyeozi ahụ mere ngwangwa bata gwa Elayị okwu.
1SA 4:15 Elayị agbaala iri afọ itoolu na afọ asatọ nʼoge a, nke mere na ọ naghị ahụkwa ụzọ.
1SA 4:16 Nwoke ahụ gwara Elayị sị, “Esi m nʼihu agha gbalata. Anọ m nʼebe ahụ taa hụ ka agha si gaa.” Elayị jụrụ sị, “Nwa m, ọ bụ gịnị mere?”
1SA 4:17 Onyeozi ahụ zara sị, “Izrel sitere nʼihu ndị Filistia gbaa ọsọ. E tigbukwara ọtụtụ nʼime ndị agha ha. Ọzọ, ụmụ gị abụọ, Hofni na Finehaz nwụrụ. E burukwara igbe ọgbụgba ndụ Chineke.”
1SA 4:18 Mgbe onyeozi ahụ kwutere maka igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Elayị sitere nʼoche ya dalaa azụ nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dajie olu ya, nwụọ! Nʼihi na o meela nnọọ agadi. Ọ bụkwa onye buru ibu. Ya onwe ya kpekwara ụmụ Izrel ikpe iri afọ anọ.
1SA 4:19 Nwunye nwa ya, bụ nwunye Finehaz, dị ime, nọọkwa nso oge ịmụ nwa ya. Mgbe ọ nụrụ maka obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nụkwa maka ọnwụ nna di ya na di ya, ọ mụpụtara nwa ya nʼike. Ma ọ nwụrụ nʼihi ihe mgbu nke afọ ime.
1SA 4:20 Ma mgbe ọ na-anwụ, ndị inyom na-eji ya ime, sịrị ya, “Atụla egwu, adala mba, ị mụọla nwa nwoke.” Ma ọ zaghị ha ihe ọbụla. Ọ ṅakwaghị ha ntị.
1SA 4:21 Ọ gụrụ nwantakịrị aha, kpọọ ya Ịkabọdụ, kwuo sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ,” nʼihi obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, na nʼihi ọnwụ nna di ya na di ya.
1SA 4:22 O kwuru sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ, nʼihi na e buuru igbe Chineke.”
1SA 5:1 Mgbe ndị Filistia buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, ha si Ebeneza buru ya buga Ashdọd.
1SA 5:2 Ha butere igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buba ya nʼime ụlọ Dagọn, dọba ya nʼakụkụ Dagọn.
1SA 5:3 Mgbe ndị Ashdọd tetara nʼisi ụtụtụ echi ya, ma lee, Dagọn adaala, kpuo ihu ya nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Ha bulikwara Dagọn elu doghachi ya nʼọnọdụ ya.
1SA 5:4 Ma nʼụtụtụ echi ya, Dagọn adakwala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Isi ya na aka ya abụọ dakapụrụ, tọgbọrọ na mbata ọnụ ụzọ, Ọ bụkwa naanị ogwe ahụ ya fọdụrụ.
1SA 5:5 Ọ bụ nke a mere, site mgbe ahụ ruo taa, ndị nchụaja Dagọn na ndị niile na-abata nʼụlọ Dagọn, adịghị azọ ụkwụ ha nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ Dagọn dị nʼAshdọd.
1SA 5:6 Aka Onyenwe anyị malitere ịdị arọ nʼahụ ndị Ashdọd, ha na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, o ji etuto dị iche iche menye ha egwu ma bibiekwa ha nʼAshdọd nʼoke ala ya niile.
1SA 5:7 Mgbe ndị Ashdọd hụrụ ihe na-eme, ha sịrị, “Anyị achọghị ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke nke Izrel dịrị nʼetiti anyị, nʼihi na aka ya dị ike nʼahụ anyị, otu aka ahụkwa na chi anyị Dagọn.”
1SA 5:8 Ya mere, ha ziri ozi kpọkọta ndịisi ndị Filistia niile, jụọ ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme igbe chi ndị Izrel?” Ha zara, “Ka e buru igbe chi ndị Izrel buga ya nʼobodo Gat.” Ya mere ha buuru igbe Chineke nke Izrel buga Gat.
1SA 5:9 Ma mgbe ha bubatara ya na Gat, akaOnyenwe anyị malitere imegide obodo ahụ. O tinyere ndị obodo ahụ nʼọnọdụ oke egwu. O tiri ndị bi nʼobodo ahụ ihe otiti, ma nwantakịrị ma dimkpa, etuto dị iche iche toro ha nʼahụ.
1SA 5:10 Ya mere, ha zilara igbe ahụ Ekrọn. Ma mgbe igbe ahụ na-abata Ekrọn, ndị Ekrọn kwara akwa sị, “Ha e burula igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel butere anyị, ka anyị na ndị anyị nwụsịa!”
1SA 5:11 Ya mere, ha kpọkọtara ndịisi ndị Filistia niile sị ha, “Sinụ nʼobodo zipụ igbe chi ndị Izrel, maọbụ zighachinụ ya nʼobodo e si bute ya na mbụ, ka ọ hapụ igbuchapụ anyị na ndị anyị.” Nʼihi egwu maka ọnwụ ejidela ndị niile bi nʼobodo. Aka Chineke dịkwa ike nke ukwuu megide obodo ahụ.
1SA 5:12 Ndị na-anwụghị ka e mere ka etuto jupụta ha nʼahụ, mkpu akwa nke ndị obodo ahụ ruru eluigwe.
1SA 6:1 Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nọrọ nʼobodo ndị Filistia ọnwa asaa.
1SA 6:2 Emesịa, ndị Filistia kpọrọ ndị nchụaja ha na ndị na-ajụ mmụọ ase jụọ ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme banyere igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị? Gwa anyị otu anyị ga-esi zilaga ya nʼala ya.”
1SA 6:3 Ndị ahụ zara sị, “Ọ bụrụ na unu ezighachi igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel, unu ezighachila ya nʼaka efu, kama jirinụ onyinye aja ikpe ọmụma zilaga ya. Unu mee nke a, ihe otiti ndị a ga-ala. Unu ga-amatakwa ihe mere o ji na-ata unu ahụhụ ndị a.”
1SA 6:4 Ha jụrụ, “Olee ụdị onyinye aja ikpe ọmụma anyị ga-enye.” A gwara ha, “Dịka ọnụọgụgụ ndịisi obodo Filistia si dị ise, unu ga-eziga onyinye oyiyi etuto ise nke e jiri ọlaedo kpụọ na oyiyi oke ise nke e jikwa ọlaedo kpụọ, nʼihi na ọ bụ otu ụdị ihe otiti ahụ ka o ji tie unu na ndịisi obodo unu niile.
1SA 6:5 Jiri ọlaedo kpụọ oyiyi etuto na oke ndị ahụ na-emebi ala unu, si otu a nye chi ndị Izrel nsọpụrụ. Ma eleghị anya ọ ga-ewezuga aka ike ya site nʼebe unu na chi unu dị iche iche na ala unu nọ.
1SA 6:6 Gịnị mere unu ga-eji nyịchie obi unu dịka ndị Ijipt na Fero mere? Mgbe Chineke mesiri ha ike, ọ bụ na ha ahapụghị ndị Izrel ka ha laa?
1SA 6:7 “Wuonụ ụgbọala ọhụrụ, werekwanụ nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide nʼụgbọ ahụ. Ehi ndị a ga-abụ ndị a na-ejibeghị kọọ ọrụ ubi mbụ. Mgbe unu kegidere ehi ndị a, chịrịnụ ụmụ ha chụba ha nʼebe a na-edebe ehi.
1SA 6:8 Werenụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị tinye nʼụgbọala ahụ, tinyekwa ihe ọlaedo ndị ahụ unu na-enye ka ọ bụrụ aja ikpe ọmụma unu nʼime igbe nta unu ga-etinye nʼakụkụ ya. Zilaganụ ya nʼụzọ ọ ga-agbaso.
1SA 6:9 Ma guzonụ na-ele ya anya. Ọ bụrụ na ọ gafee oke ala anyị banye Bet-Shemesh, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị mere ka ihe ọjọọ ndị a dakwasị anyị. Ma ọ bụrụ na o meghị otu a, ọ bụrụ na ọ lọghachi, anyị ga-amata na ihe otiti a bụ naanị ihe ndaba nke dakwasịrị anyị, o sikwaghị nʼaka Onyenwe anyị.”
1SA 6:10 Ha were dịka okwu ndị a si dị. Ha weere nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide ha nʼụgbọala ahụ, werekwa ụmụ ha kpọchie nʼọgba anụ.
1SA 6:11 Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ e tinyere oke na oyiyi etuto ọlaedo ndị ahụ a kpụrụ akpụ ka ha dọkwasịrị nʼelu ụgbọala ahụ.
1SA 6:12 Ehi ndị ahụ dọkpụrụ ụgbọ ahụ gawa nʼụzọ Bet-Shemesh. Ha na-ebekwa muuu mgbe ha na-aga. Ha sogidere ụzọ ahụ na-aga. Ha echigharịghị gaa aka nri maọbụ aka ekpe. Ndị eze ndị Filistia sogidekwara ha nʼazụ tutu rute nʼoke ala Bet-Shemesh.
1SA 6:13 Nʼoge a, ndị Bet-Shemesh nọ nʼubi na-ewe ihe ubi nke ọka wiiti na ndagwurugwu ala ahụ. Mgbe ha lepụrụ anya hụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ọṅụ juru ha obi.
1SA 6:14 Mgbe ụgbọala ahụ batara nʼubi nwoke a na-akpọ Joshua na Bet-Shemesh, ọ kwụsịrị nʼakụkụ otu nkume ukwu dị nʼebe ahụ. Ngwangwa, ndị nọ nʼebe ahụ gbuwasịrị osisi e ji mee ụgbọ ahụ, gbukwaa ehi abụọ ahụ, were ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.
1SA 6:15 Ndị ikom Livayị nọ nʼebe ahụ buliri igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ dị nʼakụkụ ya nke ọlaedo niile a kpụrụ akpụ dị nʼime ya, dọkwasị ha nʼelu nkume. Ndị Bet-Shemesh chụrụ ọtụtụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ nye Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ.
1SA 6:16 Mgbe ndị eze ise obodo ndị Filistia hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼEkrọn nʼụbọchị ahụ.
1SA 6:17 Onyinye etuto ọlaedo ise a kpụrụ akpụ nke ha nyere Onyenwe anyị dị ka aja ikpe ọmụma nʼihi ihe mere ha bụ maka obodo ndị Filistia ndị a, Ashdọd, Gaza, Ashkelọn, Gat na Ekrọn.
1SA 6:18 Ha wetakwara oke ọlaedo a dịka ọnụọgụgụ obodo ndị Filistia si dị, bụ nke ndịisi ise ahụ nwere, obodo ndị e wusiri ike, na obodo nta niile ha. Nkume ukwu ahụ ebe a dọkwasịrị igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, bụ ihe akaebe nʼubi Joshua, onye Bet-Shemesh ruo taa.
1SA 6:19 Ma Onyenwe anyị tigburu iri ndị ikom asaa nʼetiti ndị Bet-Shemesh nʼihi na ha nyobara anya nʼime igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Nʼihi ya ndị Bet-Shemesh ruru ụjụ nʼihi ndị ahụ niile Onyenwe anyị tigburu.
1SA 6:20 Ndị Bet-Shemesh jụrụ sị, “Onye pụrụ iguzo nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke a dị nsọ? Olee ebe anyị ga-ezigakwa igbe ọgbụgba ndụ a?”
1SA 6:21 Ha zipụrụ ndị ozi ka ha gaa gwa ndị Kiriat Jearim sị ha, “Ndị Filistia ezighachila igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Bịanụ buru ya gaa nʼobodo unu.”
1SA 7:1 Ya mere, ndị ikom Kiriat Jearim bịara buru igbe ọgbụgba ndụOnyenwe anyị bubata ya nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu. Ha doro Elieza, ọkpara Abinadab nsọ, ka ọ bụrụ onye na-elekọta igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
1SA 7:2 Igbe ahụ dịgidere na Kiriat Jearim ogologo oge, iri afọ abụọ zuruoke. Ma nʼoge a niile, ndị Izrel nọ na-eru ụjụ nʼihi Onyenwe anyị.
1SA 7:3 Ya mere, Samuel gwara ezinaụlọ Izrel niile sị, “Ọ bụrụ na unu ji obi unu niile na alaghachikwute Onyenwe anyị, mgbe ahụ, wezuganụ chi niile nke ndị ala ọzọ, na arụsị Ashtọret site nʼetiti unu. Kpebienụ nʼobi unu ịbịakwute Onyenwe anyị, feekwa naanị ya ofufe. Ọ ga-anapụtakwa unu site nʼaka ndị Filistia.”
1SA 7:4 Ya mere, ndị Izrel wezugara arụsị Baal na Ashtọret ha, bido ife naanị Onyenwe anyị.
1SA 7:5 Samuel gwara ha sị, “Unu ndị Izrel, zukọtaanụ na Mizpa, ka m rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ nʼisi unu.”
1SA 7:6 Mgbe ha niile zukọrọ nʼebe ahụ, ha kuuru mmiri wụpụ ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị. Nʼụbọchị ahụ kwa, ha buru ọnụ, kwupụta mmehie sị, “Anyị emehiela megide Onyenwe anyị.” Ọ bụ na Mizpa ka Samuel malitere ikpe ụmụ Izrel ikpe.
1SA 7:7 Mgbe ndị Filistia nụrụ na ụmụ Izrel zukọrọ na Mizpa, ndị eze ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha, bịa ibuso Izrel agha. Mgbe ụmụ Izrel nụrụ na ha na-abịa nso, ha tụrụ ụjọ nke ukwuu.
1SA 7:8 Ha sịrị Samuel, “Akwụsịla itiku Onyenwe anyị Chineke anyị mkpu akwa nʼihi anyị, kpeekwa ekpere ka ọ zọpụta anyị site nʼaka ndị Filistia.”
1SA 7:9 Mgbe ahụ, Samuel weere nwa atụrụ na-aṅụ ara jiri ya chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, rịọkwa Onyenwe anyị ka o nyere Izrel aka. Onyenwe anyị zara ekpere ya.
1SA 7:10 Nʼoge ahụ, mgbe Samuel nọ na-esure aja nsure ọkụ ahụ, ndị Filistia bịaruru nso ibuso Izrel agha, ma Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe were oke olu egbe eluigwe nke dara oke ụda chụsasịa ha. O mere ka ọgbaaghara bata nʼetiti ndị Filistia. Nke a mekwara ka ụmụ Izrel kpochapụ ha,
1SA 7:11 Ndị ikom Izrel si na Mizpa pụta chụso ndị Filistia ọsọ, na-etigbu ha nʼụzọ ruo na ndịda Bet-Ka.
1SA 7:12 Mgbe ahụ, Samuel weere otu nkume doo ya nʼagbata Mizpa na Shen, kpọọ ebe ahụ, Ebeneza, nke pụtara, “Nkume inyeaka,” nʼihi na ọ sịrị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyerela anyị aka ruo ugbu a.”
1SA 7:13 Ya mere, mmeri a e meriri ndị Filistia mere ka ha ghara ibuso Izrel agha ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị kwụsịrị ha ime nke a ụbọchị niile nke ndụ Samuel.
1SA 7:14 E nyeghachiri ndị Izrel obodo niile ndị Filistia dọtara nʼagha na mbụ, nke dị site nʼEkrọn ruo Gat. Ndị Izrel napụtara oke ala ndị a site nʼaka ndị Filistia. Nʼụzọ dị otu a, e mere ka udo dị nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọrait.
1SA 7:15 Samuel nọgidere dịka onye ikpe ndị Izrel ụbọchị niile nke ndụ ya.
1SA 7:16 Afọ niile, ọ na-ejegharị site nʼotu obodo ruo nʼobodo ọzọ, site nʼobodo Betel ruo Gilgal, ruokwa Mizpa. Ọ na-anọkwa nʼobodo ndị a na-ekpe ndị Izrel ikpe.
1SA 7:17 Ma ọ na-alọghachi na Rema, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka ụlọ ya dị. O kpekwara ndị Izrel ikpe nʼebe ahụ, wuokwara Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ahụ.
1SA 8:1 Mgbe Samuel ghọrọ agadi, o mere ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị ikpe ndị Izrel.
1SA 8:2 Juel, ọkpara ya, na Abija, nke na-eso ya ka ọ họpụtara. Ha nọkwa na Bịasheba na-ekpe ndị Izrel ikpe.
1SA 8:3 Ma ụmụ ya esoghị ụzọ ya. Ha na-agbaso naanị ihe ga-abara ha. Ha na-erikwa ngarị, na-ekpe ikpe na-ezighị ezi.
1SA 8:4 Nʼihi ya, ndị okenye ụmụ Izrel niile zukọtara, bịakwute Samuel na Rema sị ya,
1SA 8:5 “I meela agadi, ụmụ gị ndị ikom adịghịkwa eso ụzọ gị. Ugbu a họpụtara anyị onye ga-abụ eze anyị, onye ga na-edu anyị, dịka mba ndị ọzọ.”
1SA 8:6 Ma obi adịghị Samuel ụtọ mgbe ha rịọrọ sị, “Nye anyị eze ga-edu anyị.” Nʼihi ya, Samuel kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere.
1SA 8:7 Onyenwe anyị gwara ya, “Gee ntị nʼihe niile ndị a na-agwa gị; ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ mụ onwe m ka ha jụrụ ibu eze ha.
1SA 8:8 Site nʼụbọchị m mere ka ha si nʼIjipt pụta ruo taa, ha na-agbakụta m azụ, na-efe chi ndị ọzọ. Ọ bụkwa otu a ka ha na-eme gị ugbu a.
1SA 8:9 Mee dịka ha rịọrọ, ma echefula ịgwa ha ụdị omume eze ahụ ga-achị ha ga-emeso ha.”
1SA 8:10 Samuel gwara ndị Izrel na-arịọ ka e nye ha eze ihe Onyenwe anyị kwuru.
1SA 8:11 Ọ zara sị ha, “Ihe ndị a bụ ụdị mmeso eze ahụ ga-achị unu ga-emeso unu: Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị ikom mee ha ndị na-agba ọsọ nʼihu ụgbọ agha ya na ịnyịnya ya.
1SA 8:12 Ụfọdụ ka ọ ga-eme ọchịagha, ndị ga-elekọta ọtụtụ puku ndị agha, maọbụ iri ndị agha ise; ndị ụfọdụ ga-abụ ndị ga-akọ ubi ya, ndị ọzọ ga-ewebatakwa ihe owuwe ubi ya, ma ndị ọzọ ga-akpụrụ ya ngwa agha na ihe niile e ji anya ụgbọ agha ya.
1SA 8:13 Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị inyom mee ka ha bụrụ ndị na-esiri ya mmanụ otite na-esi isi ụtọ, na ndị na-esiri ya nri, na ndị na-eghere ya ihe oghịghe.
1SA 8:14 Ọ ga-anarakwa unu ubi unu, na ubi vaịnị unu, na ubi oliv unu ndị kachasị mma, were ha nye ndị na-ejere ya ozi.
1SA 8:15 Ọ ga-ewere otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke mkpụrụ ubi unu na ubi vaịnị unu nye ndịisi ọrụ ya na ndị na-ejere ya ozi.
1SA 8:16 Ọ ga-akwagidekwa unu ka unu nye ya ndị ohu unu, ndị ikom nʼime ha, na ndị inyom nʼime ha, ya na anụ ụlọ unu ahụ dị ezi mma, na ịnyịnya ibu unu.
1SA 8:17 Ọ ga-ewerekwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke igwe anụ ụlọ unu, meekwa ka unu onwe unu bụrụkwa ndị ohu ya.
1SA 8:18 Mgbe ụbọchị ndị ahụ bịara, mgbe ihe ndị a bidoro imezu, unu ga-akwa akwa, rịọọ ka e wezugara unu eze ahụ unu họpụtaara onwe unu, ma Onyenwe anyị agaghị aṅa unu ntị nʼụbọchị ahụ.”
1SA 8:19 Ma ndị Izrel jụrụ ige Samuel ntị. Ha sịrị, “Anyị chọrọ eze ga-achị anyị.
1SA 8:20 Mgbe ahụ, anyị onwe anyị ga-adị ka ndị mba niile ọzọ, anyị ga-enwe eze ga na-edu anyị, na-aga nʼihu anyị na-ebukwa agha anyị.”
1SA 8:21 Samuel gwara Onyenwe anyị ihe niile ha kwuru.
1SA 8:22 Ma Onyenwe anyị zara ya ọzọ sị, “Mee ihe ha kwuru, nye ha eze.” Mgbe ahụ, Samuel gwara ndị ikom Izrel okwu sị ha, “Laanụ, nwoke ọbụla nʼobodo ya.”
1SA 9:1 E nwere otu nwoke si Benjamin aha ya bụ Kish nwa Abiel, nwa Zeroa, nwa Bekorat, nwa Afia, onye Benjamin, burukwa oke mmadụ a maa ama.
1SA 9:2 O nwere nwa nwoke aha ya bụ Sọl, onye bụ okorobịa nọ nʼuju ya. O nweghị nwoke ọzọ e ji atụnyere ya nʼIzrel niile. O toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi.
1SA 9:3 Otu ụbọchị, ụfọdụ nʼime ịnyịnya ibu Kish nna Sọl nwere kpafuru. Nʼihi ya, Kish kpọrọ Sọl gwa ya okwu sị, “Duru otu odibo ka gị na ya soro ga chọgharịa ịnyịnya ibu ndị a.”
1SA 9:4 Ha chọrọ ịnyịnya ndị ahụ gaa nʼala ugwu ugwu Ifrem, na nʼakụkụ Shalisha, ma ha ahụghị ha. Ha chọkwara ha gaa nʼakụkụ Shaalim, ma ha ahụghị ha nʼebe ahụ. Emesịa, ha chọrọ ịnyịnya ibu ndị ahụ gaa nʼala niile nke ndị Benjamin, ma ha ahụghị ha ebe ọbụla.
1SA 9:5 Nʼikpeazụ, mgbe ha chọọrọ ha rute nʼala Zuf, Sọl gwara onyeozi ahụ ya na ya so, sị, “Ka anyị laghachi, nʼihi na ọ bụrụ na nna m elee anya anyị ma ọ hụghị anyị, ọ ga-amalite iche echiche banyere anyị karịa ịnyịnya ibu ndị a.”
1SA 9:6 Ma odibo ahụ zara ya sị, “Lee, e nwere otu onye nke Chineke bi nʼobodo a; ọ bụkwa onye mmadụ niile na-asọpụrụ nʼihi na ihe ọbụla o kwuru na-emezu. Ka anyị gaa hụ ya, ma eleghị anya ọ ga-agwa anyị ụzọ anyị ga-esi.”
1SA 9:7 Sọl sịrị odibo ya, “Ọ bụrụ na anyị agaa, gịnị ka anyị ga-enye nwoke ahụ? Nri dị na-akpa anyị agwụla, ọ dịkwaghị onyinye anyị nwere nke anyị ga-enye onye nke Chineke. Gịnị ka anyị nwere?”
1SA 9:8 Onyeozi ahụ zara ya ọzọ sị, “Lee, enwere m otu mkpụrụ shekel ọlaọcha. Aga m enye ya onye Chineke a ka ọ gwa anyị ụzọ anyị ga-esi.”
1SA 9:9 (Na mgbe gara aga nʼIzrel, ọ bụrụ na mmadụ agaa iju Chineke ase, ọ na-asị, “Bịa ka anyị jekwuru onye ọhụ ụzọ,” nʼihi na onye a na-akpọ onye amụma taa, ka a na-akpọ onye ọhụ ụzọ nʼoge ahụ).
1SA 9:10 Sọl sịrị odibo ya, “Ọ dị mma, Bịa ka anyị gaa.” Ha biliri gawa nʼobodo ebe onye Chineke ahụ nọ.
1SA 9:11 Mgbe ha na-arịgo ugwu ịbanye obodo ahụ, ha zutere ụfọdụ ụmụ agbọghọ ka ha na-apụta iseta mmiri, jụọ ha ajụjụ sị, “Onye ọhụ ụzọ ahụ ọ nọ nʼebe a?”
1SA 9:12 Ụmụ agbọghọ ahụ zara ha sị, “E, ọ nọ ya. Lee ya ka ọ na-aga nʼihu unu. Unu jesie ike unu ga-ahụ ya. Ugbu a ka ọ batara obodo anyị, nʼihi na ọ na-aga iso ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼebe dị elu.
1SA 9:13 Ngwangwa unu banye nʼobodo, unu ga-ahụ ya tupu o gaa nʼebe dị elu iri ihe. Nʼihi na ndị mmadụ agaghị ebido iri ihe tutu ruo mgbe o rutere, nʼihi na ọ ghaghị ịgọzi ihe aja ahụ tupu ndị a kpọrọ oku ebido iri ihe. Gbagoonụ unu ga-ahụ ya nʼoge dịka nke a.”
1SA 9:14 Ya mere, ha mere ngwangwa, baa nʼime obodo ahụ. Dịka ha na-abata nʼime obodo, lee Samuel ka ọ na-abịakwute ha; ọ na-aga nʼebe ahụ dị elu.
1SA 9:15 Ma nʼụbọchị bọrọ tupu ụbọchị Sọl na-abịa, Onyenwe anyị kpughere nke a nye Samuel.
1SA 9:16 “Dịka mgbe a echi, aga m ezitere gị otu nwoke sị nʼala Benjamin. Ị ga-ete ya mmanụ nke ga-eme ya ka ọ bụrụ onyendu Izrel ndị m. Ọ ga-azọpụta ha site nʼaka ndị Filistia, nʼihi na ahụla m ahụhụ nke ha nọ nʼime ya; anụkwala m ịkwa akwa ha.”
1SA 9:17 Mgbe Samuel hụrụ Sọl, Onyenwe anyị gwara ya sị, “Lee nwoke ahụ m gwara gị ihe banyere ya! Ọ bụ ya ga-achị ndị m.”
1SA 9:18 Ma Sọl bịaruru Samuel nso jụọ ya sị, “Biko, zi m ebe ụlọ onye ọhụ ụzọ dị.”
1SA 9:19 Samuel zara sị ya, “Mụ onwe m bụ ọhụ ụzọ ahụ. Gaanụ nʼihu m rigoruo nʼebe dị elu, nʼihi na mụ na unu ga-eso rikọọ nri taa. Nʼụtụtụ echi aga m agwa gị ihe dị gị nʼobi. Aga m ezilagakwa gị.
1SA 9:20 Enyela obi gị nsogbu maka ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu nʼabalị atọ gara aga, nʼihi na a chọtala ha. Ma, onye ka mmadụ ahụ bụ, onye ndị Izrel niile na-achọsi ike? Ọ bụghị gị na ezinaụlọ nna gị.”
1SA 9:21 Ma Sọl zara sị, “Ọ bụghị onye Benjamin ka m bụ, onye sitere nʼebo kachasị nta nʼIzrel; ọ bụghị agbụrụ m dịkarịsịrị nta nʼetiti agbụrụ niile ọzọ dị nʼebo Benjamin? Gịnị mere i ji agwa m ụdị okwu dị otu a?”
1SA 9:22 Mgbe ahụ, Samuel duuru Sọl na onyeozi ya kpọbata ha nʼime ụlọ ukwu, nye ha ọnọdụ nʼisi oche nʼetiti iri mmadụ atọ ọ kpọrọ oriri.
1SA 9:23 Samuel gwara onyeisi ndị na-esi nri okwu sị, “Weta anụ ahụ m nyere gị, nke ahụ m sị gị ka ị debe iche.”
1SA 9:24 Onye na-esi nri weere ụkwụ anụ ahụ na ihe ndị so ya debe ya nʼihu Sọl. Samuel sịrị, “Lee, ihe ndị e wepụrụ ka e debere gị. Rie, nʼihi na e debere gị ya maka oge akara aka, site nʼoge ahụ m kwuru si, ‘Akpọrọ m ndị mmadụ oku nri.’ ” Sọl sooro Samuel rie nri nʼụbọchị ahụ.
1SA 9:25 Mgbe ha sitere nʼebe ahụ dị elu rịdata nʼobodo. Samuel kpanyere Sọl ụka nʼelu ụlọ ya.
1SA 9:26 Nʼisi ụtụtụ mgbe ha biliri, Samuel kpọrọ Sọl nʼụlọ elu sị, “Jikere, ka m zilaga gị.” Mgbe Sọl kwadoro, ya na Samuel sooro pụọ nʼezi.
1SA 9:27 Ka ha na-arịda na-abịaru nsọtụ obodo ahụ, Samuel sịrị Sọl, “Gwa onyeozi ahụ ka ọ gafee nʼihu anyị.” Onyeozi ahụ mekwara otu a, ma, “Gị onwe gị chere ntakịrị oge nʼebe a ka m mee ka ị nụrụ ozi sitere nʼaka Chineke.”
1SA 10:1 Mgbe ahụ, Samuel weere karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi, sutukwa ya ọnụ nʼagba sị ya, “Ọ bụ na Onyenwe anyị etebeghị gị mmanụ ime gị onyendu ihe nketa ya?
1SA 10:2 Mgbe ị ga-ahapụ m nʼebe a, ị ga-ahụ ndị ikom abụọ nʼakụkụ ili Rechel na Zelza, nʼala Benjamin, ha ga-agwa gị, ‘A chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ugbu a, nna gị akwụsịla iche ihe gbasara ịnyịnya ibu ya, ma ọ nọkwa na-echegbu onwe ya nʼihi gị, ọ na-ajụ, “Olee ihe m ga-eme banyere ọkpara m?” ’
1SA 10:3 “Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya.
1SA 10:4 Ha ga-ajụ gị banyere ọdịmma gị, nyekwa gị ogbe achịcha abụọ, nke ị ga-anara site nʼaka ha.
1SA 10:5 “Emesịa, ị ga-aga Gibea nke Chineke, ebe ndị agha ndị Filistia mara ụlọ ikwu nche. Mgbe ị na-abata obodo ahụ, ị ga-ezute ndị amụma, ndị si nʼebe dị elu ahụ na-arịdata. Ha ga na-akpọ une, na egwu otiti, na ọja, na ụbọ akwara. Ha ga na-ebukwa amụma.
1SA 10:6 Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị ga-abịakwasị gị, ị ga-esorokwa ha buo amụma. Ị ga-abụkwa onye a gbanwere, onye dị iche.
1SA 10:7 Mgbe ihe ịrịbama ndị a mezuru ị ga na-eme ihe ọbụla i chepụtara nʼobi gị, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.
1SA 10:8 “Ị ga-aga Gilgal chere m nʼebe ahụ abalị asaa, nʼihi na ana m abịa ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo. Aga m agwa gị ihe ị ga-eme mgbe m bịara.”
1SA 10:9 Mgbe ọ na-atụgharị ka ọ si ebe Samuel nọ pụọ, Chineke gbanwere ya, nye ya obi ọhụrụ, ihe ịrịbama ndị ahụ mezukwara nʼụbọchị ahụ.
1SA 10:10 Mgbe ya na onye na-ejere ya ozi rutere Gibea, ndị amụma nọ nʼahịrị zutere ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼebe ọ dị ukwu, o sooro ha malite ibu amụma.
1SA 10:11 Mgbe ndị niile maara Sọl hụrụ ya ka o so ndị a na-ebu amụma, ha jụrụ onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị mere nwa Kish? Sọl, ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
1SA 10:12 Otu nʼime ndị bi nʼebe ahụ jụrụ sị, “Onye ka nna ha bụ?” Nke a bụ mmalite okwu ahụ a na-ekwu sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
1SA 10:13 Mgbe Sọl buchara amụma, ọ rigooro gaa nʼebe ịchụ aja ahụ dị nʼelu ugwu.
1SA 10:14 Mgbe nwanne nna ya hụrụ Sọl, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee ebe ị gara?” Sọl zara ya sị, “Anyị gara ịchọ ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ma anyị achọtaghị ha, nʼihi ya anyị gara nʼebe onye amụma a na-akpọ Samuel ịjụta ase ebe ha nọ.”
1SA 10:15 Ma nwanne nna Sọl sịrị, “Gwa m ihe Samuel gwara gị.”
1SA 10:16 Sọl zara ya sị, “Ọ gwara anyị na a chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ.” Ma okwu gbasara alaeze, dịka Samuel siri kwuo ya, ọ gwaghị ya ihe ọbụla.
1SA 10:17 Emesịa, Samuel kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile na Mizpa, ka ha bịa zute Onyenwe anyị.
1SA 10:18 Ọ gwara ha sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Mụ onwe m si nʼala Ijipt kpọpụta Izrel ma napụtakwa unu site nʼaka ike ndị Ijipt, na site nʼaka alaeze niile bụ ndị kpagburu unu.’
1SA 10:19 Ma ugbu a, unu ajụla Chineke unu onye na-azọpụta unu site nʼihe ndakwasị na nhụju anya unu niile. Unu kwukwara sị, ‘Mba, nye anyị eze ga-achị anyị.’ Ugbu a, doonụ onwe unu nʼusoro nʼihu Onyenwe anyị dịka ebo unu na ikwu unu niile si dị.”
1SA 10:20 Samuel mere ka ebo Izrel niile bịaruo nso nʼebo nʼebo, nza mara ebo Benjamin.
1SA 10:21 O mere ka ebo Benjamin bịaruo nso nʼagbụrụ nʼagbụrụ, nza mara agbụrụ Matri. Nʼikpeazụ nza ahụ mara Sọl, nwa Kish. Ha chọgharịrị ya ma ha ahụghị ya.
1SA 10:22 Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ, “Nwoke ahụ ọ bịala nʼebe a?” Onyenwe anyị sịrị, “E, Lee, o zoro onwe ya nʼetiti akpa ndị ahụ.”
1SA 10:23 Ha gbaara gaa nʼebe ahụ kpọpụta ya. Mgbe ọ pụtara guzoro nʼetiti ha, ha hụrụ na o toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi.
1SA 10:24 Samuel gwara ndị ahụ niile okwu sị, “Onye a bụ nwoke ahụ Onyenwe anyị họpụtara ka ọ bụrụ eze unu. Ọ dịghị onye ọzọ dịka ya nʼIzrel!” Mgbe ahụ, mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze dị ogologo ndụ gaa nʼihu!”
1SA 10:25 Ọzọkwa, Samuel gwara ndị Izrel ihe bụ ọrụ eze, na ihe ruuru ya. O dekwara ihe ndị a nʼakwụkwọ, debe akwụkwọ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Emesịa, Samuel mechiri nzukọ ahụ. Onye ọbụla laghachikwara nʼụlọ ya.
1SA 10:26 Mgbe Sọl laghachiri nʼobodo ya, bụ Gibea, ndị ikom ndị Chineke metụrụ aka nʼobi sooro ya.
1SA 10:27 Ma ụfọdụ ndị efulefu jọgburu onwe ha kwuru sị, “Olee otu nwoke a ga-esi zọpụta anyị?” Ha lelịrị ya anya, jụkwa iwetara ya onyinye ịnata ihuọma. Ma Sọl gbachitere ha nkịtị.
1SA 11:1 Nʼoge ahụ, Nahash, eze ndị Amọn, duuru ndị agha ya bilie imegide ndị Izrel bi nʼala Jebesh Gilead. Ma ndị Jebesh rịọrọ ya sị, “Ka anyị na gị gbaa ndụ, anyị ga-anọ nʼokpuru ọchịchị gị.”
1SA 11:2 Ma Nahash, onye Amọn zara sị ha, “Mụ na unu ga-agba ndụ ma ọ bụrụ na unu ekwenye ka m ghụpụta anya aka nri nke onye ọbụla nʼime unu, si otu a wetara Izrel niile ihe nkọcha.”
1SA 11:3 Ndị okenye obodo Jebesh zara sị, “Nye anyị abalị asaa ka anyị ziga ndị ozi nʼala Izrel niile. Ọ bụrụ na o nweghị onye kwere ịbịa zọpụta anyị, anyị ga-ewere onwe anyị nyefee gị nʼaka.”
1SA 11:4 Mgbe ndị ozi ha zipụrụ bịaruru Gibea, nke bụ obodo Sọl, ha kọọrọ ndị mmadụ ihe ndị a, ha niile dapụrụ nʼakwa.
1SA 11:5 Ma nʼoge a, Sọl si nʼubi na-alọta, soro ụmụ ehi ya nʼazụ, ọ jụrụ, “Ọ bụ gịnị na-eme onye ọbụla? Gịnị mere na ha ji ebe akwa?” Ha kọọrọ ya ihe banyere ozi e si Jebesh zite.
1SA 11:6 Mgbe Sọl nụrụ ozi a, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼike, iwe wekwara ya nke ukwuu.
1SA 11:7 Ọ kpụpụtara ehi abụọ bọkasịa ha, zipụ ndị ozi ka ha buru ha ga obodo niile dị nʼIzrel. Ozi ha ga-ezi ndị obodo ọbụla bụ nke a. “Ọ bụ ihe e mere ehi ndị a ka a ga-eme ehi onye ọbụla jụrụ iso Sọl na Samuel jee ọgụ.” Onyenwe anyị mere ka egwu jide ndị Izrel niile. Nʼihi ya, ha niile bịakwutere Sọl dịka otu mmadụ.
1SA 11:8 Mgbe Sọl kpọkọtara ha na Bezek, ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel dị narị puku atọ, tinyekwara iri puku mmadụ atọ, ndị sitere na Juda.
1SA 11:9 Ha gwara ndị zitere ozi ahụ okwu sị ha, “Zienụ ndị ikom Jebesh Gilead, ‘Echi, tupu anyanwụ achaa nʼuju ya, a ga-anapụta unu.’ ” Mgbe ndị ozi a gara zie ndị ikom Jebesh Gilead ozi a, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu.
1SA 11:10 Ndị ikom Jebesh ziri ozi gwa ndị Amọn sị ha, “Echi, anyị ga-enye unu onwe anyị, ka unu mee anyị ihe masịrị unu.”
1SA 11:11 Ma nʼụtụtụ echi, Sọl na ndị agha ya bịaruru. O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, buso ụmụ Amọn agha na mberede nʼisi ụtụtụ. O gbugidere ha ụtụtụ niile ruo mgbe anyanwụ chara nʼuju ya, chụsasịa ndị fọdụrụ nʼime ha. Nke a mere na o nweghị ebe a ga-ahụ ka ndị agha Amọn abụọ nọkọtara.
1SA 11:12 Ndị Izrel niile bịakwutere Samuel jụọ ya sị, “Olee ndị ahụ sị na Sọl agaghị abụ eze anyị? Kpọpụtara anyị ha ka anyị gbuo ha!”
1SA 11:13 Ma Sọl zara sị, “O nweghị onye ọbụla a ga-egbu taa, nʼihi na taa, Onyenwe anyị anapụtala Izrel!”
1SA 11:14 Samuel gwara ha sị, “Bịanụ ka anyị gaa Gilgal mee ịbụ eze a ka ọ dị ọhụrụ ọzọ.”
1SA 11:15 Ya mere, mmadụ niile gara Gilgal. Na mmemme pụrụ iche, ha mere Sọl eze nʼihu Onyenwe anyị. Ha chụkwara aja udo nye Onyenwe anyị nʼebe ahụ. Ọṅụ jupụtakwara nʼobi Sọl na ndị Izrel niile.
1SA 12:1 Mgbe ahụ, Samuel gwara ụmụ Izrel sị, “Lee, emeelara m unu ihe unu rịọrọ, Enyela m unu eze.
1SA 12:2 Ugbu a, unu enweela eze, onye bụ onyendu unu. Ma nʼebe mụ onwe m nọ, abụrụla m agadi isi awọ, ụmụ m ndị ikom so nọrọkwa nʼetiti unu. Abụ m onyendu unu site na mgbe m bụ okorobịa ruo taa.
1SA 12:3 Lee m ka m guzo nʼihu unu. Gbaanụ ama megide m nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu onye ya o tere mmanụ. Onye ka m zuuru ehi ya? Onye ka m zuuru ịnyịnya ibu ya? Ọ dị onye m ghọgburu? Ọ dị onye m megburu? Ọ dị onye m si nʼaka ya nara ego aka azụ ime ka m ghara ikpe ikpe ziri ezi? Gwanụ m ma ọ bụrụ na m mere ihe ndị a, aga m emezi ya.”
1SA 12:4 Ha zara sị, “Mba ọ dịbeghị mgbe ị ghọgburu anyị, maọbụ kpagbuo anyị, nʼụzọ ọbụla. O nweghịkwa onye i si nʼaka ya were ihe ọbụla.”
1SA 12:5 Samuel zara sị ha, “Onyenwe anyị bụ onye akaebe megide unu. Otu a kwa, onye ya o tere mmanụ bụ onye akaebe taa, na unu achọtaghị ihe ọbụla nʼaka m.” Ha zara sị, “E, ọ bụ onye akaebe!”
1SA 12:6 Samuel gakwara nʼihu nʼokwu ya sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị họpụtara Mosis na Erọn. Ọ bụkwa ya mere ka nna nna unu ha si nʼIjipt pụta.
1SA 12:7 Ugbu a, guzonụ jụ nʼebe a nʼihu Onyenwe anyị ka m chetara unu ihe ọma niile Onyenwe anyị meere unu na nna nna unu ha.
1SA 12:8 “Mgbe ụmụ Jekọb batara Ijipt, ha kpọkuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka. Onyenwe anyị zitere Mosis na Erọn, ndị kpọpụtara nna nna unu ha site nʼIjipt, mee ka ha bịa biri nʼebe a.
1SA 12:9 “Ma ha chefuru Onyenwe anyị bụ Chineke ha, nʼihi ya o nyefere ha nʼaka Sisera, bụ ọchịagha eze Hazọ, nakwa nʼaka ndị Filistia, na eze ndị Moab, bụ ndị lụsoro ha ọgụ.
1SA 12:10 Ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, sị ya, ‘Anyị emehiela, anyị agbakụtalaOnyenwe anyị azụ, fee arụsị Baal na Ashtọret. Ma ugbu a, napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, anyị ga-efekwa gị.’
1SA 12:11 Onyenwe anyị zitere Jerub-Baal, na Barak, na Jefta, na Samuel, ka ha zọpụta unu site nʼaka ndị iro nọ unu gburugburu, mee ka unu biri nʼudo.
1SA 12:12 “Ma mgbe unu hụrụ na Nahash, eze ndị Amọn na-achọ ibuso unu agha, unu tụrụ egwu bịakwute m sị m, ‘Mba, anyị chọrọ eze ga-achị anyị,’ nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu bụ eze unu.
1SA 12:13 Ugbu a, leenụ eze unu họpụtara, nʼihi na ọ bụ unu rịọrọ Onyenwe anyị ka o nye unu ya; Onyenwe anyị azakwala arịrịọ unu.
1SA 12:14 Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-atụ egwu Onyenwe anyị, fee ya, rubere ya isi, hapụ inupu isi nʼebe iwu ya dị, ọ bụrụkwa na unu na eze unu ga-esogide Onyenwe anyị Chineke unu, ihe niile ga-adị mma.
1SA 12:15 Ma ọ bụrụ na unu enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụ ige ya ntị, aka ya ga-abịakwasị unu nʼoke iwe, ọ ga-emekwa unu ihe o mere nna nna unu ha.
1SA 12:16 “Ugbu a, na-elenụ anya ka unu hụ ọrụ ịtụnanya niile Onyenwe anyị na-aga ịrụ.
1SA 12:17 Unu maara na ugbu a bụ oge a na-aghọ mkpụrụ ọka wiiti, ma aga m ekpe ekpere ka Onyenwe anyị zite egbe eluigwe na mmiri ozuzo taa, ka unu ghọta ụdị ihe ọjọọ unu mere nʼanya Onyenwe anyị mgbe unu rịọrọ ya sị ya nye unu eze.”
1SA 12:18 Mgbe ahụ Samuel kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zidatakwara egbe eluigwe na mmiri ozuzo nʼụbọchị ahụ. Nke a mere ka mmadụ niile tụọ Onyenwe anyị na Samuel egwu.
1SA 12:19 Ndị ahụ rịọrọ Samuel arịrịọ sị ya, “Biko kpeere anyị ekpere nye Onyenwe anyị Chineke gị ka anyị bụ ndị ohu gị ghara ịnwụ. Nʼihi na, nʼezie, anyị ejirila aka anyị mee ka mmehie anyị mụbaa site nʼịrịọ ka e nye anyị eze.”
1SA 12:20 Samuel zara sị, “Unu atụla egwu. Unu emeela ihe ọjọọ ndị a niile, ma hụkwanụ na unu ji obi unu niile fee Onyenwe anyị ofufe. Unu agbakụtakwala ya azụ nʼụzọ ọbụla.
1SA 12:21 Unu agbasola chi ndị ọzọ, nʼihi na ha abaghị uru. Ha agaghị enyere unu aka maọbụ napụta unu site nʼaka ndị iro unu.
1SA 12:22 Onyenwe anyị agaghị ahapụ ndị ya ọ họpụtara, nʼihi na-ime ihe dị otu a bụ iwetara aha ya dị ukwuu ihere. Ọ tọrọ Onyenwe anyị ụtọ ime unu mba pụrụ iche nye onwe ya.
1SA 12:23 Ma banyere mụ onwe m, ọ ga-abụrụ m ihe arụ ma a sị na m ga-emehie megide Onyenwe anyị site nʼịkwụsị ikpere unu ekpere. Aga m anọgidekwa na-ezi unu ihe ndị ahụ dị mma, na ihe ndị ahụ kwesiri ekwesi.
1SA 12:24 Naanị tụọnụ egwu Onyenwe anyị, werekwanụ obi unu fee ya ofufe nʼikwesị ntụkwasị obi; chetanụ ihe ukwuu niile o meere unu.
1SA 12:25 Ma ọ bụrụ na unu anọgide na-eme ihe ọjọọ, unu na eze unu ka a ga-ekpochapụ.”
1SA 13:1 Sọl gbara iri afọ atọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịkwara dịka eze nʼala Izrel iri afọ anọ na abụọ.
1SA 13:2 Sọl sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta puku ndị ikom atọ ka ha bụrụ ndị agha ya. Sọl na puku abụọ nọ na Mikmash nʼala ugwu ugwu Betel. Otu puku nọnyeere Jonatan na Gibea, nʼala Benjamin. Ndị ikom ndị fọdụrụ ka o zighachiri, onye ọbụla nʼụlọ ha.
1SA 13:3 Ma Jonatan busoro ndị agha Filistia nọ na Geba agha. Ndị Filistia nụkwara ihe banyere ya. Mgbe ahụ, Sọl nyere iwu ka e gbuo opi ike nʼala Izrel niile, kwuo sị, “Unu ndị Hibru niile, geenụ ntị.”
1SA 13:4 Ya mere, ụmụ Izrel niile nụrụ akụkọ ahụ nke kwuru sị, “Sọl ebusola ọmụma ụlọ ikwu ndị agha Filistia agha, nʼihi nke a, ndị Izrel niile abụrụla ndị a kpọrọ asị ugbu a nʼetiti ndị Filistia.” Ya mere, ndị agha Izrel niile pụtakwara soro Sọl gaa Gilgal.
1SA 13:5 Ndị Filistia nʼonwe ha chịkọtara ndị agha ha ibuso ndị Izrel agha. Ọnụọgụgụ ụgbọ agha ha dị puku atọ, ndị na-agba ịnyịnya ha nwere dị puku isii; ndị agha ha ndị ọzọ dị ukwu nʼọnụọgụgụ. Nʼezie, ha dị ukwuu dịka aja dị nʼọnụ osimiri. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mikmash nʼọwụwa anyanwụ Bet-Aven.
1SA 13:6 Mgbe ndị agha Izrel hụrụ na ọnọdụ ha dị njọ nke ukwuu, hụkwa na ndị iro na-emegide ha, ha zoro onwe ha nʼọgba nkume, nʼime oke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼime olulu na nʼime oghere ọbụla.
1SA 13:7 Ndị Hibru ụfọdụ gafere Jọdan ruo nʼala Gad na Gilead. Nʼoge a, Sọl nọ na Gilgal, ndị agha niile ya na ha nọ na-amakwa jijiji nʼihi ụjọ.
1SA 13:8 Samuel gwararịị Sọl ka o chere ya ruo abalị asaa, ma mgbe abalị asaa zuru Samuel abịaghị Gilgal. Nʼoge a, ndị agha Sọl malitere na-agbasasị.
1SA 13:9 Ya mere, Sọl kwuru sị, “Wetaranụ m ihe aja nsure ọkụ na nke aja udo.” Sọl chụkwara aja nsure ọkụ ahụ.
1SA 13:10 Ngwangwa ọ na-achụcha aja ndị ahụ, Samuel rutere, Sọl pụrụ izute ya, na ikele ya.
1SA 13:11 Samuel sịrị, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Sọl zara, “Mgbe m hụrụ na ndị a na-agba aghara aghara, na-esite nʼebe m nọ na-agbapụ, mgbe m lere anya lee, ma ahụghị m ka ị na-abịa dịka i kwuru, mgbe m hụkwara ndị Filistia ka ha nọ na Mikmash, na-akwado ibuso anyị agha,
1SA 13:12 echeere m, ‘Ugbu a, ndị Filistia ga-arịdakwute m ibuso m agha na Gilgal, ma arịọbeghị m ihuọma Onyenwe anyị.’ Ya mere m, m jisie ike chụọ aja nsure ọkụ ahụ.”
1SA 13:13 Samuel sịrị Sọl, “Ị kpara agwa onye nzuzu. I debeghị ihe Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu idebe. A si na i mere nke a, ọ gaara eme ka alaeze gị guzosie ike nʼebe Izrel nọ ruo mgbe niile.
1SA 13:14 Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịgide. Onyenwe anyị achọpụtala otu nwoke dịka ọchịchọ obi ya si dị, ọ họpụtakwala ya ịbụ eze nke ndị ya; nʼihi na ị debeghị ihe Onyenwe anyị nyere gị nʼiwu.”
1SA 13:15 Samuel biliri hapụ Gilgal gaa Gibea nʼala Benjamin. Mgbe Sọl gụrụ ndị agha so ya, ọ chọpụtara na ha dị naanị narị isii.
1SA 13:16 Sọl na nwa ya nwoke Jonatan, na narị mmadụ isii ndị soo ha nọ na Geba nʼala Benjamin, ebe ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Mikmash.
1SA 13:17 Ụfọdụ nʼime ndị agha Filistia kere onwe ha ụzọ atọ site nʼụlọ ikwu ndị Filistia pụta; otu ụzọ chere ihu nʼụzọ Ofra nʼakụkụ Shual,
1SA 13:18 nke ọzọ chere ihu ịga Bet-Horon, nke atọ chee ihu nʼụzọ oke ala dị na Ndagwurugwu Zeboiim, nke dị ọzara nso.
1SA 13:19 Nʼoge ahụ, e nweghị ike ịchọta otu ọkpụ ụzụ nʼala Izrel, nʼihi na ndị Filistia sịrị, “Ma ọ bụghị otu a, ndị Hibru ga-akpụtara onwe ha mma agha maọbụ ùbe.”
1SA 13:20 Izrel niile na-ejekwuru ndị Filistia maka ịmụ ọgụ igwuze ala ha, maọbụ mma oge ha, maọbụ anyụike ha, maọbụ mma ha ji ewe ihe ubi.
1SA 13:21 Ihe ha na-akwụ maka ịmụ ọgụ igwuze ala, na mma oge ha bụ ụzọ abụọ nke shekel e kere ụzọ atọ, maka ịmụ anyụike, na ndụdụ, ya na ịpị ndụdụ e ji achị ehi bụ, otu ụzọ nke shekel e kere ụzọ atọ.
1SA 13:22 Nke mere na ahụtaghị mma agha maọbụ ùbe ọbụla nʼaka ndị agha Izrel nʼụbọchị agha ahụ, ma ọ bụghị naanị nke dị nʼaka Sọl na Jonatan.
1SA 13:23 Ugbu a ndị Filistia e kewapụtara iche a pụọla gaa nʼụzọ warawara dị na Mikmash.
1SA 14:1 Otu ụbọchị, Jonatan nwa Sọl, kpọrọ nwokorobịa na-ebu ihe agha ya sị, “Bịa, ka anyị gafee ndagwurugwu jeruo nʼụlọ ikwu ndị Filistia.” Ma ọ gwaghị Sọl nna ya.
1SA 14:2 Sọl na narị ndị ikom isii ya na-anọdụ nʼebe dị anya site na Gibea, nʼokpuru osisi pomegranet dị na Migrọn.
1SA 14:3 Otu nʼime ndị so Sọl bụ Ahija onye nchụaja, onye yi efọọd. Ọ bụ nwa Ahitub, onye bụ nwanne Ịkabọdụ. Ahitub bụ nwa nwa Finehaz, onye bụ nwa Elayị, onye nchụaja Onyenwe anyị na Shaịlo. Ọ dịkwaghị onye ma na Jonatan apụọla.
1SA 14:4 Tupu Jonatan eruo ebe ndị Filistia nọ, ọ ghaghị isite na nwa ụzọ warawara dị nʼagbata nkume abụọ, a na-akpọ Bozez na Sene gabiga.
1SA 14:5 Nkume nke dị nʼakụkụ elu elu, dị nʼihu Mikmash, nke dị nʼakụkụ ndịda dị nʼihu Geba.
1SA 14:6 Jonatan gwara nwokorobịa na-ebu ihe agha ya sị, “Bịa, ka anyị gafee ga nʼebe nguzo ndị ahụ a na-ebighị ugwu, ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-alụrụ anyị ọgụ. Nʼihi na ọ dịghị ihe pụrụ igbochi Onyenwe anyị ịzọpụta, site nʼọtụtụ mmadụ, maọbụ ole na ole.”
1SA 14:7 Nwokorobịa ahụ zara sị ya, “Gaa nʼihu, eji m obi m na mmụọ m na-eso gị dịka ọchịchọ gị si dị.”
1SA 14:8 Jonatan gwara ya sị, “Bịa ka anyị ga, lee ihe anyị ga-eme. Anyị ga-apụkwuru ndị agha ahụ mee ka ha hụ anyị anya.
1SA 14:9 Ọ bụrụ na ha asị, ‘Guzonụ ebe ahụ ruo mgbe anyị bịakwutere unu,’ anyị ga-echere ebe anyị nọ, anyị agaghị agakwuru ha.
1SA 14:10 Ma ọ bụrụ na ha sị, ‘Rigokwutenụ anyị,’ anyị ga-emekwa otu ahụ, nʼihi na ọ ga-abụrụ anyị ihe ama na Onyenwe anyị enyela ha nʼaka anyị.”
1SA 14:11 Ya mere, ha abụọ guzoro ebe ndị Filistia ga-ahụ ha. Mgbe ndị Filistia hụrụ ha, ha tiri mkpu sị, “Lee, ndị Hibru esitela nʼọnụ ebe ha zoro na-arịpụta.”
1SA 14:12 Ndị ikom ndị na-anọ nʼebe nguzo ndị nche tikuru Jonatan na onye ahụ na-ebu ngwa agha ya sị, “Rigokwutenụ anyị, ka anyị mee unu ihe.” Jonatan gwara onye ahụ na-ebu ngwa agha, “Soro m nʼazụ rigota, nʼihi na Onyenwe anyị ewerela ha nyefee nʼaka Izrel.”
1SA 14:13 Ya mere, Jonatan ji ikpere ya na aka ya rigoruo nʼebe ahụ; onye na-ebu ihe agha ya sokwa ya nʼazụ. Ma ndị agha Filistia daghachiri azụ mgbe Jonatan na onye na-ebu ihe agha ya bidoro igbu ha.
1SA 14:14 Na ogbugbu mbụ ahụ, Jonatan na onye ahụ na-ebu ngwa agha ya gburu ọnụọgụgụ ndị Filistia dị iri abụọ. Ọ bụ nʼihe ha ka nketa ala ruru otu ọkara nʼekaa nʼọtụtụ.
1SA 14:15 Oke ọma jijiji dakwasịrị ndị agha niile, na ndị nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, ma ndị nọ nʼọhịa, ma ndị nọ nʼebe dịpụrụ adịpụ, ma ndị na-ejegharị ejegharị ibu agha. Ala ahụ niile mara jijiji. Ọ bụ ọma jijiji nke Chineke zitere.
1SA 14:16 Ndị nche Sọl, bụ ndị nọ na Gibea nʼime Benjamin, lepụrụ anya hụ igwe ndị agha ka ha malitere ịgba barịị nʼihu na-azụ.
1SA 14:17 Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị agha ya na ha so, “Gụọnụ ndị agha ọnụ, chọpụta onye na-anọghị nʼebe a.” Mgbe ha mere nke a, ha chọpụtara, na Jonatan na onye na-ebu ihe agha ya anọghị nʼebe ahụ.
1SA 14:18 Sọl sịrị Ahija, “Bute igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” (Nʼoge ahụ igbe ọgbụgba ndụ dị nʼaka ụmụ Izrel.)
1SA 14:19 Mgbe Sọl na-agwa onye nchụaja okwu, ụzụ na iti mkpu nke na-ada nʼụlọ ikwu ndị Filistia dara karịa, nʼihi ya, Sọl gwara onye nchụaja ahụ okwu sị ya, “Sepụ aka gị.”
1SA 14:20 Mgbe ahụ, Sọl na ndị niile ya na ha nọ jikọtara onwe ha baa nʼagha ahụ, ma lee, ndị Filistia ji mma agha na-egburita onwe ha. Ọgbaaghara dịkwa nʼebe niile.
1SA 14:21 Ma ndị Hibru, ndị so ndị Filistia na-alụ ọgụ, tụgharịrị dịnyere ndị Izrel soro Sọl na Jonatan.
1SA 14:22 Emesịa, ndị ikom Izrel niile, ndị ahụ zoro onwe ha nʼala ugwu ugwu Ifrem pụtara, mgbe ha hụrụ na ndị Filistia na-agba ọsọ. Ha gbapụtara soro ndị ọzọ ịchụ ndị Filistia ọsọ.
1SA 14:23 Ya mere, Onyenwe anyị napụtara ndị Izrel nʼụbọchị ahụ. E buru agha ahụ gabiga Bet-Aven.
1SA 14:24 Ma ndị ikom Izrel nọ ọnọdụ nhụju anya nʼụbọchị ahụ, nʼihi na Sọl jiri ịṅụ iyi kechie ha, mgbe o kwuru sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ onye ga-eri nri ọbụla site ugbu a ruo anyasị, tutu ruo mgbe m bọsịrị ọbọ megide ndị iro m!” Nʼihi ya, o nweghị onye ọbụla nʼetiti ndị agha ya detụrụ ihe oriri ọnụ.
1SA 14:25 Ndị agha ahụ niile banyere nʼọhịa ebe mmanụ aṅụ dị nʼala.
1SA 14:26 Mgbe ha banyere nʼọhịa, ha hụrụ mmanụ aṅụ ebe ọ na-asọpụta, ma o nweghị onye metụrụ aka nʼọnụ ya, nʼihi na ha tụrụ egwu iyi ahụ ha ṅụrụ.
1SA 14:27 Ma Jonatan anụghị na nna ya mere ka ndị ahụ ṅụọ iyi, ya mere, o setịpụrụ ọnụ ọnụ mkpanaka dị ya nʼaka rụta mmanụ aṅụ na ugbugbo ya, tinye nʼọnụ ya rachaa. Nke a mere ka ike ya laghachite.
1SA 14:28 Ma otu onye agha gwara ya sị, “Nna gị ji ịṅụ iyi gbaa ndị agha niile iwu, sị, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ, onye riri nri taa. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji ada mba.’ ”
1SA 14:29 Jonatan zara sị, “Nna m esitela nʼiwu dị otu a wetara ala anyị nsogbu. Lee ka m si nweta ike site na mmanụ aṅụ nta m rachara.
1SA 14:30 Ọ garaghị aka mma ma a sị na ndị ikom riri ihe ha si nʼaka ndị iro ha kwata nʼagha? Ọ bụ na ogbugbu a gaara egbu ndị Filistia agaraghị adị ukwuu karịa?”
1SA 14:31 Ma ndị agha Izrel bu agụụ tigbuo ndị Filistia, chụọkwa ha ọsọ site na Mikmash ruo Aijalon. Ha dakwara mba karịa.
1SA 14:32 Ha dakwasịrị ihe a kwatara nʼagha, gbuo atụrụ na ehi na ụmụ ehi, bido iri anụ ha na ndụ nʼihi agụụ.
1SA 14:33 Ma otu onye gwara Sọl sị, “Ndị ikom Izrel na-emehie megide Onyenwe anyị site na iri anụ ọbara ya dị nʼahụ ya.” Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ihe dị otu a jọgburu onwe ya. Nutenụ nkume ukwuu nʼebe a ugbu a.”
1SA 14:34 Sọl sịrị, “Gaa nʼetiti ndị ikom a gwa ha, ‘Ka onye ọbụla weta ehi na atụrụ ha chọrọ igbu nʼebe a, ka e gbuo ha nʼebe a, rie anụ ha. Unu emehiela megide Onyenwe anyị site nʼiri anụ ọbara dị nʼime ya.’ ” Ya mere, onye ọbụla wetara ehi ya nʼabalị ahụ, gbuo nʼebe ahụ.
1SA 14:35 Emesịa, Sọl wuuru Onyenwe anyị ebe ịchụ aja. Nke a bụ ebe ịchụ aja nke mbụ o wuru.
1SA 14:36 Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị agha ya sị, “Ka anyị gaa chụọ ndị Filistia ọsọ nʼabalị a niile, ma gbukwaa onye ọbụla fọdụrụ nʼime ha.” Ndị agha ya zara sị, “Ọ dị mma, mee dịka ị kwuru.” Ma onye nchụaja sịrị, “Ka anyị buru ụzọ jụta ihe bụ uche Chineke.”
1SA 14:37 Mgbe ahụ, Sọl jụrụ Chineke sị, “Ọ bụ m rịda gaa chụso ndị Filistia? Ị ga-enyefe ha nʼaka ndị Izrel?” Ma Chineke enyeghị ya ọsịsa ọbụla nʼụbọchị ahụ.
1SA 14:38 Sọl gwara ndịisi agha Izrel okwu sị, “Ihe emebiela! Anyị aghaghị ịchọpụta ụdị mmehie anyị mere taa, nke mere Onyenwe anyị ji jụ inye anyị ọsịsa.
1SA 14:39 Nʼezie dịka Onyenwe anyị, onye na-azọpụta Izrel na-adị ndụ, a sịkwarị na ọ bụ nwa m Jonatan ka a chọpụtara na ọ bụ ya ka ikpe mara, ọ ga-anwụ!” Ma ọ dịghị onye gwara ya ihe ọbụla.
1SA 14:40 Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị Izrel niile okwu sị ha, “Guzonụ onwe unu nʼebe ahụ, mụ na nwa m Jonatan ga-eguzo onwe anyị nʼebe a.” Ndị ahụ zara sị, “Mee ihe ọbụla dị gị mma.”
1SA 14:41 Mgbe ahụ, Sọl kpere ekpere nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, “Gịnị mere na ị zabeghị ohu gị taa? Ọ bụrụ na ikpe mara m maọbụ nwa m Jonatan, zaa site nʼUrim, ma ọ bụrụ ndị ikom Izrel ka ikpe mara, nye ọsịsa site na Tumim.” Nza ahụ mara Jonatan na Sọl, ma ikpe amaghị ndị ikom Izrel.
1SA 14:42 Mgbe ahụ, Sọl kwuru sị, “Ugbu a feenụ nza nʼetiti mụ na Jonatan, nwa m nwoke.” Nza ahụ mara Jonatan.
1SA 14:43 Sọl gwara Jonatan okwu sị ya, “Gwa m ihe i mere.” Jonatan zara sị ya, “Ọ bụ naanị mmanụ aṅụ ntakịrị ka m ji ọnụ mkpanaka m rụrụ rachaa. Ọ pụtara na m ga-anwụ nʼihi ya?”
1SA 14:44 Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Nʼezie Jonatan, ị ghaghị ịnwụ. Ka Chineke meso m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si sie ike, ma ọ bụrụ na ị nwụghị nʼihi ihe a i mere.”
1SA 14:45 Ma ndị ikom ahụ sịrị Sọl, “Jonatan ọ ga-anwụ, bụ onye a wetara nzọpụta a dị ukwuu nʼIzrel? Nke a apụghị ime! Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ọ bụladị otu agịrị isi agaghị esi nʼisi ya dapụ, nʼihi na Chineke ejirila ya rụọ ọrụ ịtụnanya dị ukwuu taa.” Ya mere, ndị agha ahụ zọpụtara Jonatan, e gbukwaghị ya.
1SA 14:46 Emesịa, Sọl kwụsịrị ndị agha ya ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ndị Filistia nʼonwe ha lakwara nʼala nke ha.
1SA 14:47 Site nʼoge Sọl malitere ịchị nʼIzrel, o buru agha megide ndị iro ha nʼakụkụ niile, ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị eze Zoba na ndị Filistia. Ebe ọbụla o chere ihu ọ na-alụgbu.
1SA 14:48 O buru agha dị ukwuu, lụgbuo ndị Amalek; ma zọpụta ndị Izrel site nʼaka ndị niile na-emegbu ha site nʼịpụnarị ha ihe ha nwere.
1SA 14:49 Sọl mụtara ndị ikom atọ; Jonatan, Ishvi na Malkishua. Ọ mụtakwara ụmụ agbọghọ abụọ, Merab na Mikal.
1SA 14:50 Aha nwunye Sọl bụ Ahinoam, ada Ahimaaz. Ọchịagha Sọl bụ Abna, nwa Nea, nwanne nna Sọl.
1SA 14:51 Nea, nna Abna, na Kish, nna Sọl bụ ụmụnne. Ha bụ ụmụ Abiel.
1SA 14:52 Ndị Izrel na ndị Filistia nọ nʼagha dị egwu ụbọchị niile Sọl bụ eze. Mgbe ọbụla Sọl hụrụ nwoke dị ike, maọbụ dimkpa, ọ na-eduru ya mee ya ka ọ bụrụ otu nʼime ndị agha ya.
1SA 15:1 Samuel sịrị Sọl, “Mụ ka Onyenwe anyị zitere ite gị mmanụ ka ị bụrụ eze ndị ya, bụ Izrel. Ya mere, gee ntị nʼozi sitere nʼaka Onyenwe anyị bịa.
1SA 15:2 Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Aga m ata ndị Amalek ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere Izrel, mgbe ha nọchiri ha nʼụzọ oge ha si Ijipt pụta.
1SA 15:3 Ugbu a, gaa buso ndị Amalek agha. Gbuchapụ ihe niile ha nwere. Enwekwala ọmịiko nʼahụ ha. Gbuo ndị ikom niile, ndị inyom niile, ụmụntakịrị niile na ụmụ na-aṅụ ara, igwe ehi na atụrụ, ịnyịnya kamel na ịnyịnya ibu ha niile.’ ”
1SA 15:4 Ya mere, Sọl chịkọtara ndị agha ya mee ka ha zukọtaa nʼobodo Telaim. Ọnụọgụgụ ha dị narị puku abụọ, ndị agha ji ụkwụ, tinyere puku ndị ikom iri si na Juda.
1SA 15:5 Sọl duuru ndị agha ya gaa zoo nʼakụkụ iyi tara ata dị nso nʼobodo ndị Amalek.
1SA 15:6 Sọl zigaara ndị Ken ozi sị ha, “Sitenụ nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe unu ka m ghara ibibikọta unu na ha. Nʼihi na unu gosiri ndị Izrel obiọma mgbe ha si nʼIjipt pụta.” Ya mere, ndị Ken sitere nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe ha.
1SA 15:7 Sọl busoro ndị Amalek agha site na Havila ruo Shua, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Ijipt.
1SA 15:8 O jidere Agag, eze ndị Amalek na ndụ, ma jiri mma agha gbuchapụ ndị ya niile.
1SA 15:9 Ma Sọl na ndị agha ya debere Agag ndụ, debekwa atụrụ na ehi kachasị mma, na ụmụ ebule na atụrụ gbara abụba, na ihe ndị ọzọ niile mara mma. Nʼezie, ihe ọbụla dị mma nʼanya ka ha jụrụ ibibi. Ma ihe ndị ọzọ niile nke na-amasịghị ha, na nke na-abaghị uru, ka ha bibiri.
1SA 15:10 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Samuel ntị,
1SA 15:11 “Ọ na-ewute m na m mere Sọl ka ọ bụrụ eze, nʼihi na o nupuru isi site nʼokwu m, jụ ime ihe m nyere ya nʼiwu.” O wutere Samuel nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru. Ya mere, o tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa abalị ahụ niile.
1SA 15:12 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Samuel pụrụ gawa ịchọ Sọl. Otu onye gwara ya sị, “Sọl agaala nʼugwu Kamel iwuru onwe ya ihe ncheta. Ọ ga-esitekwa ebe ahụ gaa Gilgal.”
1SA 15:13 Nʼikpeazụ, mgbe Samuel hụrụ ya, Sọl ji oke ọṅụ kelee Samuel sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri agọzi ka ị bụ. Lee, emeela m ihe niile Onyenwe anyị kwuru!”
1SA 15:14 Ma Samuel jụrụ ya sị, “Gịnị bụ ube atụrụ ndị a m na-anụ? Ebee ka ube igwe ehi ndị a si na-ada?”
1SA 15:15 Sọl zara sị, “Ndị agha m si nʼetiti ndị Amalek chịta ụfọdụ nʼime atụrụ na ehi ndị mara mma nke ha chọrọ iji chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja. Ma anyị bibiri ihe ndị ọzọ fọdụrụnụ.”
1SA 15:16 Mgbe ahụ Samuel gwara Sọl sị, “Ekwukwala ọzọ! Gee ntị nụrụ ihe Onyenwe anyị gwara m nʼabalị!” Sọl zara ya sị, “Kwuo, gịnị ka ọ gwara gị?”
1SA 15:17 Samuel gwara ya sị, “Ọ bụghị ezie nʼagbanyeghị na ị dịrịị ntakịrị nʼanya gị onwe gị, ma ị bụụrụ onyeisi ndị ebo Izrel niile? Onyenwe anyị tere gị mmanụ ibu eze ndị Izrel.
1SA 15:18 Onyenwe anyị ziri gị ijere ya ozi, gwa gị sị, ‘Gaa, laa ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị Amalek nʼiyi; buso ha agha ruo mgbe ị kpochapụrụ ha niile.’
1SA 15:19 Gịnị mere i geghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị ime ihe o kwuru? Gịnị mere i ji chụrụ ihe nkwata gaa, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị?”
1SA 15:20 Ma Sọl sịrị ya, “Ma erubeere m Onyenwe anyị isi. Ejere m ozi ahụ Onyenwe anyị zigara m. Anwụtara m Agag eze Amalek na ndụ, ma gbuchapụ ndị Amalek niile.
1SA 15:21 Ndị agha sitere nʼihe a kwatara nʼagha were ụfọdụ atụrụ na ehi, bụ ndị kachasị mma nʼetiti ihe ndị ahụ e debere iche maka ịla ha nʼiyi, iji ha chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja na Gilgal.”
1SA 15:22 Ma Samuel sịrị, “Ihe na-atọ Onyenwe anyị ụtọ ọ bụ onyinye na aja nsure ọkụ dịka nrube isi nye ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta? Nrube isi dị mma karịa ịchụ aja ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebule.
1SA 15:23 Nʼihi na nnupu isi dịka mmehie ịgba afa, mpako dịkwa njọ dịka ikpere arụsị. Nʼihi na ị jụla okwu Onyenwe anyị ya onwe ya ajụkwala gị dịka eze.”
1SA 15:24 Sọl zara Samuel sị ya, “Emehiela m. Nʼezie, enupula m isi na ndụmọdụ gị na nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ bụ nʼihi na m tụrụ egwu ndị Izrel ka m ji mee ihe ha chọrọ.
1SA 15:25 Biko, gbaghara m mmehie m ugbu a, bịakwa soro m ka m gaa fee Onyenwe anyị ofufe.”
1SA 15:26 Ma Samuel sịrị ya, “Agaghị m eso gị laghachi azụ. Ebe ị jụrụ okwu Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ajụkwala gị dịka eze ndị Izrel!”
1SA 15:27 Mgbe Samuel tụgharịrị ka o si nʼebe ahụ pụọ, Sọl jidere ya nʼọnụ ọnụ uwe ya ime ka ọ lọghachi azụ, ma uwe ahụ dọwara.
1SA 15:28 Mgbe ahụ, Samuel zara sị ya, “Taa Onyenwe anyị adọwapụla alaeze Izrel site nʼaka gị were ya nyefee otu nʼime ndị agbataobi gị, onye ka gị mma.
1SA 15:29 Chineke, onye bụ Ebube Izrel, anaghị agha ụgha; ọ nakwaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị mmadụ efu!”
1SA 15:30 Ma Sọl malitekwara ịrịọ arịrịọ ọzọ sị, “Emehiela m. Ma, sọpụrụ m ugbu a nʼihu ndị okenye ndị m, na nʼihu ndị Izrel. Lọghachi soro m ka m gaa fee Onyenwe anyị Chineke gị ofufe.”
1SA 15:31 Ya mere, Samuel kwenyere soro Sọl laghachi, Sọl kpọkwara isiala nye Onyenwe anyị.
1SA 15:32 Mgbe ahụ, Samuel gwara ya okwu sị ya, “Kpọpụtara m Agag, eze ndị Amalek.” Agag ji ihu ọchị bịakwute ya, nʼihi na o chere sị, “Nʼezie oge ọnwụ agaala.”
1SA 15:33 Ma Samuel kwuru sị, “Dịka mma agha gị sị gbawa ndị inyom aka ụmụ otu a ka nne gị ga-esi bụrụ onye na-enweghị nwa nʼetiti ndị inyom.” Samuel gburu Agag nʼihu Onyenwe anyị na Gilgal.
1SA 15:34 Emesịa, Samuel lara nʼụlọ ya na Rema. Ma Sọl laghachikwara na Gibea, obodo nke aka ya.
1SA 15:35 Site nʼoge ahụ ruo mgbe Samuel nwụrụ, ọ hụkwaghị Sọl anya ọzọ. Ma o rugidere ụjụ nʼihi Sọl oge ndị a niile. O wutekwara Onyenwe anyị na o mere Sọl eze ndị Izrel.
1SA 16:1 Emesịa Onyenwe anyị sịrị Samuel, “Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide na-eru ụjụ nʼihi Sọl, ebe ọ bụ na m ajụla ya dịka eze ndị Izrel? Ugbu a, gbajuo mmanụ na mpi gị, bilie ije. Ana m eziga gị ka ijekwuru Jesi onye Betlehem, ahọrọla m otu onye ga-abụ eze site nʼetiti ụmụ ya ndị ikom.”
1SA 16:2 Ma Samuel zara sị, “Oleekwanụ otu m ga-esi gaa nʼebe ahụ? Ọ bụrụ na Sọl anụ ya, ọ ga-egbu m.” Onyenwe anyị sịrị, “Were nwaagbọghọ ehi, jiri ya nʼaka, sị, ‘Abịara m ịchụrụ Onyenwe anyị aja.’
1SA 16:3 Ị ga-akpọ Jesi ka ọ bịa soro nʼọchụchụ aja ahụ. Mgbe ahụ, aga m egosi gị ihe ị ga-eme. Ị ga-etekwara m ya mmanụ, bụ onye m nke ga-egosi gị.”
1SA 16:4 Samuel mere ihe Onyenwe anyị kwuru. Mgbe o rutere na Betlehem, ndị okenye obodo ahụ ji ịma jijiji pụta izute ya. Ha jụrụ ya sị “Ọ dịkwa mma? Udo ọ dịkwa?”
1SA 16:5 Ma Samuel zara ha sị “E, udo dị, Abịara m ịchụrụ Onyenwe anyị aja. Doonụ onwe unu nsọ bịa soro m gaa ịchụ aja ahụ.” O dokwara Jesi na ụmụ ya ndị ikom nsọ, gwakwa ha ka ha soro gaa.
1SA 16:6 Mgbe ha ruru, Samuel hụrụ Eliab kwuo nʼobi ya sị, “Nʼezie, onye nke Onyenwe anyị tere mmanụ na-eguzo nʼihu Onyenwe anyị.”
1SA 16:7 Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi.”
1SA 16:8 Jesi kpọrọ Abinadab ka ọ gafee nʼihu Samuel. Ma Samuel sịrị, “Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”
1SA 16:9 Jesi mere ka Shama bịa gafee, ma Samuel sịrị, “Mba Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”
1SA 16:10 Ụmụ ndị ikom Jesi asaa si otu a gafee nʼihu Samuel, ma Samuel sịrị ya, “Onyenwe anyị ahọrọghị ndị a.”
1SA 16:11 Ọ jụrụ Jesi sị, “Ndị a ọ gwụchaala ụmụ ndị ikom ị mụtara?” Jesi zara sị “O fọdụrụ ọdụdụ nwa m, ma ọ nọ nʼọhịa na-azụ atụrụ.” Samuel sịrị, “Ziga ozi kpọlata ya, anyị agaghị anọdụ ala tutu ruo mgbe ọ bịara.”
1SA 16:12 Ọ zigara ozi ka akpọọ ya, mee ka ọ bịa. O nwere ụcha ahụ pụrụ iche, nwee anya mara mma, dịkwa mma ile anya. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Samuel okwu sị ya, “Ọ bụ onye a, bilie tee ya mmanụ.”
1SA 16:13 Ya mere, Samuel weere mpi ahụ mmanụ dị tee ya nʼihu ụmụnne ya. Site nʼụbọchị ahụ Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Devid nʼebe ọ dị ukwuu. Emesịa, Samuel laghachiri na Rema.
1SA 16:14 Ugbu a, Mmụọ Onyenwe anyị esitela nʼime Sọl pụọ, Onyenwe anyị zitekwara mmụọ ọjọọ nke bịara na-esogbu Sọl.
1SA 16:15 Ndị na-ejere Sọl ozi gwara ya okwu sị, “Lee, mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa na-enye gị nsogbu.
1SA 16:16 Biko, ka onyenwe anyị nye ndị ohu ya nọ nʼebe a ike, ka ha gaa chọta onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ ga-akpọ ụbọ akwara mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa bịakwasịrị gị, ime ka ahụ dị gị mma.”
1SA 16:17 Sọl kwenyere sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ chọta ma kpọtara m nwoke na-akpọ ụbọ akwara nke ọma.”
1SA 16:18 Otu onye nʼime ndị na-eje ozi kwuru sị, “Lee, ahụla m otu nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, onye Betlehem, onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ bụ dike na ọka nʼagha. Ọ bụ onye na-ekwu okwu nke ọma, na nwoke mara mma ile anya. Onyenwe anyị nọnyekwara ya.”
1SA 16:19 Sọl zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Jesi sị ya, “Zitere m nwa gị nwoke Devid, onye na-azụrụ gị atụrụ.”
1SA 16:20 Ya mere Jesi zipụrụ Devid ka o jekwuru Sọl. O mekwara ka Devid duru otu ịnyịnya ibu nke o bukwasịrị achịcha, na otu karama akpụkpọ mmanya, na otu nwa ewu, onyinye a na-enye Sọl.
1SA 16:21 Devid bịakwutere Sọl, banye nʼọrụ ijere ya ozi. Sọl hụrụ ya nʼanya nke ukwuu, nʼihi ya, Devid ghọrọ otu nʼime ndị na-ebu ihe agha Sọl.
1SA 16:22 Mgbe ahụ, Sọl ziri Jesi ozi sị ya, “Biko, kwere ka Devid bụrụ otu nʼime ndị agha m, nʼihi na ihe ya na-atọ m ụtọ.”
1SA 16:23 Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ si nʼebe Chineke nọ bịa malitere inye Sọl nsogbu, Devid na-akpọ ụbọ akwara ya. Ahụ Sọl na-adajụkwa, mmụọ ọjọọ ahụ na-esitekwa nʼebe ọ nọ wezuga onwe ya.
1SA 17:1 Nʼoge a, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha ọnụ, zukọtaa nʼobodo Sokoh nke dị na Juda maka ibu agha. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼEfes Damim, nke dị nʼagbata Sokoh na Azeka.
1SA 17:2 Mgbe ahụ, Sọl na ndị Izrel niile zukọtara maa ụlọ ikwu nke ha na ndagwurugwu Ịla. Ha doro onwe ha nʼusoro agha izute ndị Filistia.
1SA 17:3 Ndị Filistia doro onwe ha nʼelu ugwu nʼotu akụkụ, ma ndị Izrel dokwara onwe ha nʼelu ugwu nʼakụkụ nke ọzọ. Ndagwurugwu dịkwa nʼetiti ha.
1SA 17:4 Mgbe ahụ, otu onye ọka agha aha ya bụ Golaịat, onye obodo Gat, sitere nʼetiti ụlọ ikwu ndị Filistia pụta. Nwoke a toro ogologo nke ukwuu; ịdị ogologo ya ga-erukwa mita atọ.
1SA 17:5 O kpu okpu agha e ji bronz kpụọ, ma yiri uwe agha nke ịdị arọ bronz e ji kpụọ ya ga-erukwa iri kilogram ise na asaa.
1SA 17:6 O yikwa ihe agha o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ nke e ji bronz kpụọ, nyakwasịkwa nʼubu ya ùbe e ji bronz kpụọ.
1SA 17:7 A kpụrụ ùbe ya ka ọ dịrị ka osisi e ji ekwe akwa, jiri igwe ịdị arọ ya ga-eru kilogram asaa kpụọ ọnụ ọnụ ùbe ahụ. Onye na-ebu ọta o ji ekpuchi obi ya nọkwa nʼihu ya.
1SA 17:8 Golaịat guzoro kpọkuo ndị agha Izrel sị ha, “Gịnị mere unu ga-eji pụta guzo nʼusoro ibu agha. Ọ bụ na m abụghị onye Filistia? Ọ bụkwa na unu onwe unu abụghị ndị ozi Sọl? Họpụtaranụ onwe unu otu nwoke, ka ọ bịakwute m.
1SA 17:9 Ọ bụrụ na onye ahụ unu họpụtara etigbuo m, anyị ga-abụrụ unu ndị ohu, ma ọ bụrụkwanụ na m etigbuo ya, unu ga-abụrụ anyị ndị ohu!”
1SA 17:10 Mgbe ahụ, onye Filistia ahụ sịrị, “Taa, ana m ama usuu ndị agha Izrel aka nʼihu! Kpọpụtaranụ m otu nwoke ka mụ na ya lụọ ọgụ.”
1SA 17:11 Mgbe Sọl na ndị agha Izrel nụrụ ihe onye Filistia a kwuru, ha mara jijiji tụọkwa oke egwu.
1SA 17:12 Ma Devid bụ nwa Jesi, onye Efrat nke Betlehem dị na Juda. Jesi mụtara ndị ikom asatọ. Nʼoge nke Sọl, ọ ghọọla agadi nwoke.
1SA 17:13 Atọ nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, ndị bụ okenye, soro Sọl gaa agha. Aha ha bụ Eliab, ọkpara ya, Abinadab, nwa nke abụọ na Shama, nwa nke atọ.
1SA 17:14 Devid bụ ọdụdụ nwa. Ụmụnne ya ndị okenye atọ na-eso Sọl.
1SA 17:15 Ma Devid na-apụ jekwuru Sọl, ma na-alaghachikwa nʼụlọ ịzụ atụrụ nna ya na Betlehem.
1SA 17:16 Golaịat, onye Filistia na-abịaru nso ụtụtụ na uhuruchi, na-eguzo onwe ya otu a iri ụbọchị anọ.
1SA 17:17 Otu ụbọchị, Jesi gwara Devid okwu sị, “Bịa ka i wegara ụmụnne gị otu akpa ọka ndị a e ghere eghe. Chịrịkwa ogbe achịcha iri ndị a chịlara ha.
1SA 17:18 Wegakwara onyeisi usuu ha, iri chiizi, ndị a. Chọpụta otu ihe si agara ụmụnne gị natakwa ha ihe ị ga-egosi anyị na ha dị ndụ.”
1SA 17:19 Ha na Sọl na ndị ikom Izrel niile, nọ na ndagwurugwu Ịla, na-ebuso ndị Filistia agha.
1SA 17:20 Devid biliri njem nʼisi ụtụtụ, hapụ igwe atụrụ ya nʼaka onye na-elekọta atụrụ, buru onyinye ndị ahụ gawa dịka Jesi nyere ya nʼiwu. Ọ bịarutere ụlọ ikwu ndị Izrel mgbe ha na-apụ nʼihu agha, ha na-etikwa mkpu agha.
1SA 17:21 Ndị Izrel na ndị Filistia dokwara onwe ha nʼusoro izute onwe ha nʼagha, ndị agha megide ndị agha.
1SA 17:22 Devid hapụrụ ihe ndị ahụ nʼaka onye na-elekọta akpa niile, gbara ọsọ gaa nʼusoro ndị agha jụọ ụmụnne ya banyere udo ha.
1SA 17:23 Ma mgbe ha na ya nọ na-akparịta ụka, onye mmeri nʼọgbọ agha, onye Filistia nke Gat, Golaịat bụ aha ya, sitere nʼusoro ndị agha Filistia pụta, kwuokwa okwu niile ahụ dịka ọ na-ekwu na mbụ. Devid nụrụ ihe o kwuru.
1SA 17:24 Mgbe ndị Izrel niile hụrụ nwoke a, ha gbara ọsọ pụọ nʼihu ya ma tụọkwa oke egwu.
1SA 17:25 Ndị Izrel sịrị, “Unu hụrụ nwoke a na-eguzo onwe ya? Ọ bụ ka ọ kparịa nnọọ ndị Izrel ka o ji apụta? Eze kwere nkwa inye onye ọbụla ga-etigbu ya akụ nʼebe ọ bara ụba. Ọ ga-akpọnyekwa ya nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya, meekwa ka ndị ezinaụlọ onye ahụ gharakwa ịtụ ụtụ taks ọzọ nʼIzrel!”
1SA 17:26 Devid jụrụ ndị ikom nọ ya nso, “Gịnị ka a ga-emere nwoke ga-etigbu onye Filistia a, meekwa ka mkparị a ghara ịdịrị Izrel ọzọ? Onye ka onye Filistia a a na-ebighị ugwu bụ, na ọ ga-apụta na-akparị ndị agha Chineke dị ndụ?”
1SA 17:27 Ha gwara ya otu ihe ahụ ha kwuru na mbụ sị ya na ọ bụ ihe ahụ ka a ga-emere onye gburu ya.
1SA 17:28 Mgbe Eliab, nwanne Devid nke okenye, nụrụ ka ya na ndị ikom ahụ na-ekwu okwu, o were iwe dị ọkụ megide ya, jụọ ya sị, “Gịnị ka ị bịara ime nʼebe a? Onye kwa ka ị hapụrụ atụrụ ole na ole ndị ahụ nʼọzara? Amaara m ụdị nganga dị nʼime gị na echiche ọjọọ juru gị obi. Ihe ị ji bịa nʼebe a bụ naanị ka ịhụchata ihe na-eme nʼagha.”
1SA 17:29 Ma Devid zara sị ya, “Oleekwanụ ihe m mere ugbu a? Adara m iwu nʼihi na m jụrụ ajụjụ?”
1SA 17:30 Devid chigharịkwara jekwuru onye ọzọ jụọkwa ya otu ajụjụ ahụ. Ọ natakwara otu ụdị ọsịsa ahụ.
1SA 17:31 Nʼikpeazụ, mgbe a matara ihe bụ uche Devid, e mere ka Sọl mara ihe banyere Devid. Sọl zikwara ozi ka a kpọọ ya.
1SA 17:32 Devid sịrị Sọl, “Ka obi onye ọbụla ghara ịda mba nʼihi onye Filistia a; ohu gị ga-aga lụso ya ọgụ.”
1SA 17:33 Ma Sọl zaghachiri, “Ị pụghị ibuso onye Filistia a agha, megide ya, nʼihi na i bụ naanị nwantakịrị, ma ya onwe ya bu onye na-ebu agha siterị na mgbe ọ bụ okorobịa.”
1SA 17:34 Ma Devid gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ,
1SA 17:35 achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya.
1SA 17:36 Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye Filistia a na-amaghị Chineke otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha Chineke dị ndụ!
1SA 17:37 Onyenwe anyị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!” Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, “Gaa, ka Onyenwe anyị nọnyere gị.”
1SA 17:38 Mgbe ahụ, Sọl yinyere Devid uwe ime ahụ nke ya, yikwasịkwa ya uwe agha igwe, ma kpukwasị ya okpu bronz nʼisi.
1SA 17:39 Devid fanyere mma agha nʼime uwe ahụ, malite ijegharị ije, nʼihi na ọ maghị otu e si eyi uwe ndị ahụ ejegharị. Ọ dịghị anya, o gwara Sọl okwu sị, “Agaghị m eyi uwe ndị a nʼihi na o doghị m ahụ.” Ya mere, Devid yipụrụ ha.
1SA 17:40 Emesịa, o were mkpanaka ya nʼaka ya, site nʼiyi họpụta nkume ise dị mụrụmụrụ tinye ha nʼakpa nta dị nʼime akpa onye ọzụzụ atụrụ ya. O jidere ebe ya nʼaka ya, malite ịpụkwuru onye Filistia ahụ.
1SA 17:41 Onye Filistia ahụ, na-abịa nso na-apụkwute Devid, onye ahụ na-ebu ọta ya na-agakwa nʼihu ya.
1SA 17:42 O lere Devid anya hụ na ọ bụ naanị nwantakịrị nwoke, onye ahụ dị mma, onye mara mma ile anya. Nʼihi ya, o ledara Devid anya.
1SA 17:43 Ọ sịrị Devid, “Abụ m nkịta, na i ji mkpanaka na-abịakwute m?” Onye Filistia ahụ ji aha chi niile ya bụọ Devid ọnụ.
1SA 17:44 Ọ sịrị, “Bịa nʼebe a ka m were anụ ahụ gị mere anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa niile ihe oriri!”
1SA 17:45 Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị.
1SA 17:46 Taa ka Onyenwe anyị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel.
1SA 17:47 Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na Onyenwe anyị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke Onyenwe anyị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.”
1SA 17:48 Mgbe onye Filistia ahụ na-abịa nso ibuso ya agha, Devid jiri ọsọ gbara gaa nʼihu agha izute ya.
1SA 17:49 Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye Filistia ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala.
1SA 17:50 Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya.
1SA 17:51 Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe Golaịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya! Mgbe ndị Filistia hụrụ na onye ọka agha ha adaala nwụọ, ha tụgharịrị gbawa ọsọ.
1SA 17:52 Mgbe ahụ, ndị agha Izrel na Juda tiri mkpu ọṅụ, biliekwa, malite ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ha chụrụ ha ọsọ chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama Gat, na nʼọnụ ụzọ ama Ekrọn. Ndị Filistia nwụrụ anwụ dara nnọọ aghara aghara nʼụzọ Shaaraim nke gawara Gat na Ekrọn.
1SA 17:53 Emesịa, ndị Izrel lọghachiri bịa kwakọrọ ihe niile dị nʼụlọ ikwu ndị Filistia, nke ha hapụrụ gbaa ọsọ.
1SA 17:54 Devid buuru isi onye Filistia bulata na Jerusalem. Ma dobe ngwa agha onye Filistia ahụ nʼime ụlọ ikwu nke ya.
1SA 17:55 Mgbe Sọl nọ na-ele Devid anya ka ọ na-apụ izute onye Filistia ahụ, ọ sịrị Abna, ọchịagha ya, “Abna, nwa onye ka nwokorobịa ahụ bụ?” Abna zara sị, “Dịka i si adị ndụ, eze, amaghị m.”
1SA 17:56 Eze zara sị, “Chọpụta onye mụrụ nwokorobịa a.”
1SA 17:57 Mgbe Devid si nʼigbu onye Filistia ahụ lọghachi, Abna duuru ya, dute ya nʼihu Sọl. Isi onye Filistia a dịkwa nʼaka Devid.
1SA 17:58 Sọl jụrụ ya sị, “Nwokorobịa, nwa onye ka ị bụ?” Devid zara sị, “Abụ m nwa ohu gị nwoke Jesi onye Betlehem.”
1SA 18:1 Mgbe Devid gwasịrị Sọl okwu, ịhụnanya dị ukwuu malitere nʼetiti Jonatan na Devid. Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya.
1SA 18:2 Sọl mere ka Devid nọgide nʼụlọeze. O kwekwaghị ka ọ laghachi nʼụlọ nna ya.
1SA 18:3 Jonatan na Devid gbara ndụ nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya.
1SA 18:4 Jonatan yipụtara uwe o yi nʼahụ nye ya Devid, nyekwa ya uwe ime ahụ ya, na ọ bụladị mma agha ya, ma ụta ya na eriri ukwu ya.
1SA 18:5 Devid jeziri ozi niile Sọl ziri ya, o mere ihe niile nke ọma nke a mere na Sọl nyere ya ọkwa dị elu nʼetiti ndị agha ya. Ọnọdụ a dị mma nʼanya ndị Izrel nakwa nʼanya ndị agha Sọl.
1SA 18:6 Mgbe ndị agha ahụ na-alọghachite, mgbe Devid gbusịrị onye Filistia ahụ, ndị inyom sitere nʼobodo niile nke Izrel pụta izute eze Sọl. Ha na-abụ abụ na-ete egwu ọṅụ, nke ha ji ụbọ akwara na ihe egwu ndị ọzọ na-eti.
1SA 18:7 Dịka ha na-ete egwu, ha bụrụ abụ sị, “Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị agha ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị agha.”
1SA 18:8 Nke a were Sọl iwe nke ukwuu. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Gịnị bụ nke a? Ha enyela Devid ugwu dịka onye gburu iri puku kwụrụ puku ndị agha, ma mụ onwe m ka ha nyere naanị ugwu dịka onye gburu ọtụtụ puku ndị agha. Gịnị ọzọ fọdụrụ ya ugbu a, ma ọ bụghị naanị inweta alaeze?”
1SA 18:9 Site nʼụbọchị ahụ gawa, Sọl malitere ile Devid anya ọjọọ.
1SA 18:10 Nʼechi ya, mmụọ ọjọọ Chineke zitere bịara dakwasị Sọl, ọ malitekwara ibu amụma nʼụlọ ya. Ma Devid kpọrọ ụbọ akwara dịka ọ na-eme mgbe ọbụla. Ma nʼoge a, o nwere ùbe dị Sọl nʼaka.
1SA 18:11 Ọ tụrụ ùbe ahụ, kwuo nʼobi ya sị, “Aga m atụgide Devid nʼaja ụlọ ahụ.” Ma Devid wezugara onwe ya, ugboro abụọ ndị a.
1SA 18:12 Sọl na-atụ Devid egwu, nʼihi na Onyenwe anyị ahapụla Sọl, ma nọnyere Devid.
1SA 18:13 Emesịa, Sọl mere ihe ga-eme ka ọ ghara ịhụkwa Devid anya ọzọ. O mere Devid ka ọ bụrụ onye na-elekọta puku ndị agha, ndị ọ na-edu na-aga ibu agha.
1SA 18:14 Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma, nʼihi na Onyenwe anyị na-anọnyere ya.
1SA 18:15 Mgbe Sọl hụrụ na ọ bụ onye nwere uche nke ọma, ọ tụrụ ya ụjọ.
1SA 18:16 Ma Izrel na Juda niile hụrụ Devid nʼanya, nʼihi na ọ na-edu ha nʼagha.
1SA 18:17 Sọl gwara Devid okwu sị ya, “Lee ada m nwanyị Merab. Aga m akpọnye gị ya, ka ị lụọ ya. Naanị jeere m ozi, lụọkwa agha Onyenwe anyị.” Nʼihi na Sọl kwuru nʼime obi ya sị, “Agaghị m ewelite aka m megide ya. Ka ndị Filistia mee nke ahụ.”
1SA 18:18 Ma Devid sịrị Sọl, “Onyekwanụ ka m bụ, gịnịkwa bụ ezinaụlọ m maọbụ agbụrụ m nʼIzrel, nke m ga-eji bụrụ ọgọ nwoke eze?”
1SA 18:19 O ruo, na mgbe a ga-eduru Merab, ada Sọl dunye Devid, akpọrọ ya nye Adriel, onye Mehola ka ọ lụọ.
1SA 18:20 Nʼoge a, a chọpụtara na Mikal, ada Sọl hụrụ Devid nʼanya, mgbe e mere ka Sọl mata nke a, obi tọrọ ya ụtọ.
1SA 18:21 O kwuru nʼobi ya sị, “Aga m akpọnye ya nwa m nwanyị, ka ọ bụrụ ihe ịma nʼọnya nye ya, ka aka ndị Filistia si otu a megide ya.” Ya mere, Sọl gwara Devid sị ya, “Ugbu a i nwekwara ohere ọzọ ịghọ ọgọ m nwoke.”
1SA 18:22 Sọl nyere ndị ohu ya iwu sị, “Gwanụ Devid okwu na nzuzo sị ya, ‘Lee, ihe banyere gị masịrị eze, ndị niile na-ejere ya ozi hụkwara gị nʼanya. Ugbu a, kwerenụ ịbụ ọgọ ya.’ ”
1SA 18:23 Ha gwara Devid okwu ndị a niile. Ma Devid zara sị, “Ọ bụ ihe nta ịbụ ọgọ eze? Mụ onwe m bụ onye ogbenye, onye a na-amaghị ama.”
1SA 18:24 Mgbe ndị ohu Sọl gwara Sọl ihe Devid kwuru,
1SA 18:25 ọ gwara ha sị, “Gwanụ Devid, ‘Eze achọghị ihe ọzọ dịka ụgwọ isi akụ ọbụla karịa naanị narị apị ndị Filistia. Ka ọ bụrụ ọbọ ọ ga-abọrọ m nʼisi ndị iro m.’ ” Ma ihe Sọl bu nʼobi bụ na a ga-egbu Devid nʼọgụ ahụ.
1SA 18:26 Mgbe ndị ohu eze gwara Devid ihe eze kwuru, ọ tọrọ ya ụtọ, nʼihi ya, o kwenyere ịbụ ọgọ eze. Tupu oge ahụ a kara aka eruo,
1SA 18:27 Devid na ndị agha ya pụrụ gbuo narị ndị Filistia abụọ, werekwa apị ha gosi eze. Sọl kpọnyere Devid Mikal, nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya.
1SA 18:28 Mgbe Sọl hụrụ na Onyenwe anyị na-anọnyere Devid, hụkwa na Mikal nwa ya nwanyị hụrụ Devid nʼanya,
1SA 18:29 ọ tụrụ Devid ụjọ karịa na mbụ. Sọl kpọkwara Devid asị, gụọ ya dịka onye iro ụbọchị ndụ ya niile.
1SA 18:30 Ndịisi agha Filistia na-apụta ibu agha dịka ha na-eme mgbe ọbụla, ma Devid na-eme nke ọma karịa ndị ọchịagha Sọl ndị ọzọ niile. Nke a mere ka Devid ghọọ onye a mara aha ya nʼala ahụ niile.
1SA 19:1 Sọl gwara ndị ohu ya na ọkpara ya, Jonatan, ka ha gbuo Devid. Ma nʼihi na ihe banyere Devid masịrị Jonatan,
1SA 19:2 ọ dọrọ ya aka na ntị, “Nna m Sọl na-achọ ohere igbu gị. Lezie anya chee ndụ gị nche, ụtụtụ echi, gaa nʼebe ị ga-ezo onwe gị nọdụ nʼebe ahụ.
1SA 19:3 Mụ na nna m ga-eso bịa nʼakụkụ ọhịa ebe ahụ i zoro onwe gị. Aga m agwa ya okwu banyere gị. Ihe ọbụla m chọpụtara, aga m agwa gị.”
1SA 19:4 Jonatan kwuru okwu ọma banyere Devid nye Sọl nna ya sị ya, “Ka eze ghara ime ihe ọjọọ megide Devid bụ ohu ya. O nwebeghị ihe ọjọọ o mere gị. Nʼezie, ihe niile o mere bụ ihe baara gị uru nke ukwuu.
1SA 19:5 Ọ kpọrọ ndụ ya asị mgbe o gburu onye Filistia ahụ. Onyenwe anyị nyekwara ndị Izrel niile mmeri dị ukwuu. Obi dịkwa gị ụtọ mgbe ị hụrụ nke a. Gịnị mekwaranụ i ga-eji mejọọ nwoke aka ya dị ọcha dịka Devid, site nʼigbu ya ebe ọ bụ na ikpe amaghị ya?”
1SA 19:6 Sọl ṅara Jonatan ntị ṅụọkwa iyi sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị egbu ya.”
1SA 19:7 Emesịa, Jonatan kpọrọ Devid gwa ya ihe mere. Jonatan duuru Devid gaa nʼihu Sọl. Ihe niile dizikwara dịka ọ dị na mbụ.
1SA 19:8 Agha ọzọ dakwara. Nʼoge a, Devid duuru ndị agha ya pụọ ibuso ndị Filistia agha. O gburu ọtụtụ nʼime ha, chụọkwa ndị agha Filistia ọsọ.
1SA 19:9 Ma mmụọ ọjọọ Onyenwe anyị zitere bịakwasịrị Sọl dịka ọ nọ nʼime ụlọ ya, ùbe ya dịkwa ya nʼaka. Mgbe Devid na-akpọ nʼụbọ akwara,
1SA 19:10 Sọl tụrụ ùbe ahụ ka ọ tugbuo Devid nʼahụ aja, ma ọ gbapụrụ site nʼihu Sọl, ma ùbe ahụ manyere nʼaja ụlọ ahụ. Devid gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya nʼabalị ahụ.
1SA 19:11 Sọl zipụrụ ndị agha ka ha chee ụlọ Devid nche, gbuo ya mgbe ọ pụtara nʼụtụtụ. Ma Mikal nwunye Devid gwara ya sị, “Ọ bụrụ na ị gbapụghị, zoo onwe gị nʼabalị a, onye nwụrụ anwụ ka ị ga-abụ nʼụtụtụ echi.”
1SA 19:12 Ya mere, Mikal sitere na oghereikuku wetuo Devid, ebe o si gbapụ.
1SA 19:13 Emesịa, Mikal kwagharịrị ihe ndina Devid, were ihe a kpụrụ akpụ tụkwasị nʼelu ya, werekwa akwa kpuchie ya, tinye ihe ajị ewu nʼebe isi ya.
1SA 19:14 Mgbe ndị agha ahụ bịaruru ijide Devid na ịkpụgara ya Sọl, Mikal gwara ha sị, “Ahụ esighị ya ike.”
1SA 19:15 Mgbe ahụ, Sọl zighachiri ndị ahụ azụ nʼebe Devid nọ si ha, “Bute ya na ihe ndina o dina nʼelu ya, ka m gbuo ya.”
1SA 19:16 Mgbe ndị ikom ahụ batara, ha hụrụ ihe a kpụrụ akpụ ka ọ dị nʼelu ihe ndina, hụkwa ajị ewu ka ọ dị nʼakụkụ ebe isi nke ihe ndina ahụ.
1SA 19:17 Sọl jụrụ Mikal sị, “Gịnị mere i ji ghọgbuo m otu a, mee ka onye iro m gbalaga?” Mikal zara, “Ọ bụ ya sịrị m, ‘Hapụ m ka m pụọ, nʼihi gịnị ka m ga-eji gbuo gị?’ ”
1SA 19:18 Mgbe Devid gbara ọsọ gbalaga, ọ gakwuru Samuel na Rema, kọrọ ya ihe niile Sọl mere ya. Ya na Samuel gara biri na Naịọt.
1SA 19:19 Ozi ruru Sọl ntị, “Devid nọ na Naịọt nʼime Rema,”
1SA 19:20 ya mere, o zipụrụ ndị ikom ka ha gaa jide ya. Ma mgbe ha rutere, ha hụrụ otu ndị amụma ka ha na-ebu amụma, hụkwa Samuel ka ọ na-eguzo nʼebe ahụ dịka onyeisi ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ndị ozi Sọl ahụ, mee ka ha malitekwa ibu amụma.
1SA 19:21 Mgbe Sọl nụrụ ihe mere, o zipụkwara ndị agha ọzọ, ma ha onwe ha bukwara amụma! Otu ihe ahụ mekwara ndị o zipụrụ nke ugboro atọ.
1SA 19:22 Nʼikpeazụ ya onwe ya pụrụ gaa Rema, ruo nʼolulu mmiri Seku. Ọ jụrụ, “Ebee ka Samuel na Devid nọ?” Ha sịrị, “Ha nọ na Naịọt nke Rema.”
1SA 19:23 Ya mere, Sọl gara Naịọt nke dị na Rema. Ma Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya, dịka ọ na-aga nʼụzọ ọ malitere ibu amụma tutu ruo mgbe ọ bịaruru Naịọt.
1SA 19:24 O yipụrụ uwe ya buo amụma nʼihu Samuel. Ọ gba ọtọ dinara ala nʼebe ahụ ehihie ahụ, na abalị ahụ niile. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
1SA 20:1 Devid sitere na Naịọt nʼime Rema gbapụ ọsọ, chọta Jonatan, sị ya, “Ọ bụ gịnị ka m mere? Gịnị bụkwa ihe ọjọọ m mere? Olee ụzọ m si mejọọ nna gị, mere o ji na-achọsi ike ka ọ napụ m ndụ m?”
1SA 20:2 Jonatan sịrị ya, “Nke a abụghị eziokwu. Ị gaghị anwụ! Ihe dị otu a adịghị nna m nʼobi, nʼihi na ọ na-agwa m ihe ọbụla ọ na-ezube ime, ọ bụladị ihe ukwu maọbụ ihe ntakịrị. Amakwaara m na ọ gaghị ezonarị m ihe dị otu a. Mba, ọ bụghị eziokwu.”
1SA 20:3 Devid ṅụrụ iyi sị, “Nna gị maara nke ọma na m anatala amara nʼebe ị nọ, nʼihi ya, o kwuola nʼime onwe ya sị, ‘Agaghị m agwa Jonatan, ka ọ ghara iwute ya.’ Ma eji m Onyenwe anyị na mkpụrụobi gị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụ naanị otu nzọ ụkwụ dị ugbu a nʼetiti mụ na ọnwụ.”
1SA 20:4 Jonatan sịrị Devid, “Ihe ọbụla ị chọrọ ka m mee, aga m emere gị ya.”
1SA 20:5 Devid sịrị ya, “Lee echi ga-abụ mmemme ọnwa ọhụrụ, e kwesiri m iso eze rie nri. Ma hapụ m ka m ga zoo onwe m nʼọhịa tutu ruo uhuruchi nke nwanne echi.
1SA 20:6 Ọ bụrụ na nna gị ajụọ ase m, sị ya, ‘Devid rịọsiri m arịrịọ ike ka m hapụ ya ka ọ gbaga Betlehem, bụ obodo ya, nʼihi a na-achụ aja nke dịrị agbụrụ ya kwa afọ.’
1SA 20:7 Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ọ dị mma,’ mgbe ahụ, udo ga-adịrị ohu gị. Ma ọ bụrụ na o wee iwe nke ukwuu, mara nʼezie na o zubere ime m ihe ọjọọ.
1SA 20:8 Ma gị onwe gị, meere ohu gị ebere, nʼihi na i meela ka o sooro gị baa nʼọgbụgba ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na ikpe mara m, gị onwe gị gbuo m. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji nyefee m nʼaka nna gị?”
1SA 20:9 Jonatan sịrị, “Agaghị m eme ya, lee, a sịkwa na m maara na nna m na-achọ igbu gị, ọ bụ na m agaghị agwa gị?”
1SA 20:10 Devid jụrụ ya, “Onye ga-agwa m ma ọ bụrụ na nna gị aza gị okwu ike ike?”
1SA 20:11 Jonatan sịrị ya, “Bịa ka anyị pụọ gaa nʼọhịa.” Ya mere, ha abụọ pụrụ jee nʼọhịa.
1SA 20:12 Jonatan gwara Devid sị, “Eji m aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwe nkwa na-asị gị, nʼoge ugbu a echi, maọbụ nwanne echi, aga m akpanyere nna m ụka banyere gị, meekwa ka ị mata ihe ọ na-eche banyere gị. Ọ bụrụ na obi dị ya mma nʼebe ị nọ, aga m eme ka ị mata.
1SA 20:13 Ma ọ bụrụ na nna m na-achọ imerụ gị ahụ, ka Onyenwe anyị mesoo Jonatan mmeso, otu ọbụla o si dị njọ, ma ọ bụrụ na m abịaghị gwa gị, zilaga gị ka ị laa nʼudo. Ka Onyenwe anyị nọnyere gị dịka o si nọnyere nna m.
1SA 20:14 Chetakwa, i ghaghị igosi m ịhụnanya na obi ebere Onyenwe anyị, ma ọ bụrụ na m anwụọ.
1SA 20:15 E wezugakwala ịhụnanya gị na obi ebere gị site nʼebe ezinaụlọ m dị, ọ bụladị mgbe Onyenwe anyị bipụchara ndị iro Devid niile site nʼelu ụwa.”
1SA 20:16 Jonatan na ụlọ Devid gbara ndụ. O kwuru sị, “Ka Onyenwe anyị kpee ndị iro Devid niile ikpe.”
1SA 20:17 Jonatan mere ka Devid site nʼịhụnanya ọ hụrụ ya ṅụọra ya iyi. Nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka ọ hụrụ onwe ya.
1SA 20:18 Mgbe ahụ, Jonatan sịrị Devid, “Echi bụ mmemme ọnwa ọhụrụ. A ga-ele anya gị, nʼihi na ọnọdụ gị ga-atọgbọrọ nʼefu.
1SA 20:19 Nwanne echi ya, nʼoge uhuruchi, gaa nʼebe ahụ i zoro onwe gị mgbe nsogbu a malitere, chere nʼebe ahụ, nʼakụkụ nkume Ezel.
1SA 20:20 Aga m abịa gbaa àkụ atọ nʼakụkụ ya dịka a ga-asị na o nwere ihe m chọrọ iji ụta m gbata.
1SA 20:21 Emesịa, aga m ezipu otu nwantakịrị sị ya, ‘Gaa chọta àkụ ndị ahụ.’ Ọ bụrụ na ị nụ ka m na-agwa ya okwu sị, ‘Lee àkụ ndị a dị nʼakụkụ azụ gị, chita ha ebe a,’ mgbe ahụ, pụta nʼihi, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, udo dịrị gị, egwu ọbụla adịghị.
1SA 20:22 Ma ọ bụrụ na m agwa nwantakịrị ahụ okwu sị ya, ‘Lee, àkụ ahụ dị nʼihu gị,’ ọ pụtara na ị ghaghị isi nʼebe a pụọ, nʼihi na Onyenwe anyị ezipụla gị.
1SA 20:23 Ma ihe banyere okwu ahụ anyị kwuru, cheta na Onyenwe anyị bụ onye akaebe, nʼetiti mụ na gị ruo mgbe ebighị ebi.”
1SA 20:24 Ya mere, Devid gara zoo onwe ya nʼọhịa. Mgbe oge mmemme ọnwa ọhụrụ ruru, eze Sọl nọdụrụ ala iri nri.
1SA 20:25 Ọ nọdụrụ ọdụ nʼakụkụ aja ụlọ, bụ ebe ọ dị mbụ anọ, na ncherita ihu Jonatan. Abna nọdụrụ nʼakụkụ Sọl, ma oche Devid na-anọ enweghị onye nọ ya.
1SA 20:26 Sọl ekwughị ihe ọbụla banyere ya nʼụbọchị ahụ, nʼihi na o chere na ọ dị ihe ndaba mere, nke tinyere Devid nʼọnọdụ adịghị ọcha. Sọl kwuru nʼobi ya sị, “E, ọ ghaghị ịbụ ihe kpatara ya.”
1SA 20:27 Ma nʼechi ya, bụ abalị nke abụọ nke ọnwa ọhụrụ, ọnọdụ Devid tọgbọrọ nʼefu ọzọ. Mgbe ahụ, Sọl sịrị nwa ya Jonatan, “Gịnị mere nwa Jesi abịaghị iso rie nri, ma ụnyaahụ ma taa?”
1SA 20:28 Jonatan zara sị, “Devid rịọrọ sị m nye ya ike ka ọ gaa Betlehem.
1SA 20:29 Ọ sịrị m, ‘Kwere ka m gaa nʼihi na ndị ezinaụlọ anyị nwere aja mmemme ha na-eme nʼobodo. Nwanne m nwoke nyere m iwu sị m na m aghaghị ịbịa. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼebe ị nọ, biko kwere ka m gaa hụ ụmụnne m.’ Ọ bụ nke a mere ọ bịaghị na tebul eze.”
1SA 20:30 Iwe were Sọl nke ukwuu. Ọ gwara Jonatan okwu nʼiwe sị ya, “Gị nwa nke nwanyị na-enupu isi, nke uche ya gbagọrọ agbagọ. Ị na-eche na m amaghị na i dịnyere nwa Jesi si otu a wetara onwe gị na nne gị ihe ihere?
1SA 20:31 Nʼihi na ụbọchị niile nwa Jesi dị ndụ nʼụwa a, ọnọdụ gị na alaeze gị agaghị eguzosi ike. Ugbu a, pụọ, zipụ ozi kpọtara m ya ka m gbuo ya!”
1SA 20:32 Jonatan jụrụ nna ya Sọl sị, “Gịnị ka o mere? Nʼihi gịnị ka a ga-eji mee ka ọ nwụọ?”
1SA 20:33 Ma Sọl tụrụ ùbe o ji nʼaka ya ka o jiri ya tugbuo Jonatan, ma Jonatan zere ya. Nke a mere ka Jonatan mata nʼezie na nna ya na-achọ igbu Devid.
1SA 20:34 Jonatan si na tebul ahụ bilie nʼoke iwe pụọ, o righịkwa nri nʼụbọchị nke abụọ nke mmemme ahụ, nʼihi na omume ihere nna ya mesoro Devid wutere ya hie nne.
1SA 20:35 Nʼụtụtụ echi ya, dịka ha kara aka, Jonatan gara nʼọhịa, ya na nwantakịrị nwoke so gaa.
1SA 20:36 Ọ sịrị nwantakịrị nwoke ahụ, “Gbara ọsọ gaa chọta àkụ ndị ahụ niile m na-agba.” Mgbe nwantakịrị ahụ na-agba ọsọ na-aga, Jonatan gbapụrụ àkụ, gbafee ya nʼihu nwantakịrị ahụ.
1SA 20:37 Mgbe nwokorobịa ahụ na-ejeru nso ebe àkụ ahụ Jonatan gbara dị, Jonatan kpọkuru ya sị ya, “Àkụ ahụ dị nʼihu gị.”
1SA 20:38 Mgbe ahụ, o tiri mkpu sị, “Mee ngwangwa! Gawa ọsịịsọ! Eguzokwala!” Nwokorobịa ahụ chịkọtara àkụ ndị ahụ niile gbaghachikwute nna ya ukwu.
1SA 20:39 Ma nwantakịrị nwoke ahụ aghọtaghị ihe Jonatan mere; ma Jonatan na Devid maara ihe gara.
1SA 20:40 Jonatan nyere nwokorobịa ahụ ụta ya na àkụ ndị ahụ ka ọ chighachi ha nʼobodo.
1SA 20:41 Mgbe nwokorobịa ahụ lara, Devid biliri site nʼakụkụ ndịda nkume ahụ ebe o zoro onwe kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala ugboro atọ, nʼihu Jonatan. Ha suritere onwe ha ọnụ, bekọkwaa akwa. Ma Devid kwara akwa karịa.
1SA 20:42 Nʼikpeazụ, Jonatan gwara Devid okwu sị, “Gaa nʼudo, nʼihi na anyị ejirila aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi ịbụ enyi nʼetiti onwe anyị, na-asị, ‘Onyenwe anyị bụ onye akaebe nʼebe mụ na gị, na nʼebe ụmụ ụmụ m, na ụmụ ụmụ gị nọ ruo mgbe ebighị ebi.’ ” Ha kewara. Devid malitere ịpụ, ma Jonatan tụgharịrị baa nʼobodo.
1SA 21:1 Devid jere nʼobodo Nob ịhụ Ahimelek, onye nchụaja. Ahimelek mara jijiji mgbe ọ hụrụ Devid. Ọ sịrị Devid, “Gịnị mere naanị gị ji bịa? Gịnị mere o nweghị onye so gị?”
1SA 21:2 Devid zara Ahimelek, onye nchụaja sị, “Eze ziri m ozi dị mkpa, ma sị m, ‘Ka onye ọbụla ghara ịma ihe ọbụla banyere ozi a m na-eziga gị.’ Ma banyere ụmụ okorobịa m, agwala m ha ebe ha ga-ezute m.
1SA 21:3 Ugbu a, olee ihe oriri i nwere? Nye m ogbe achịcha ise maọbụ ihe ọzọ i nwere.”
1SA 21:4 Onye nchụaja ahụ zara Devid sị, “Enweghị m achịcha ana edoghị nsọ nʼebe a. Ma otu ọ dị, e nwere ụfọdụ achịcha e doro nsọ nʼebe a, ma ọ bụrụ na ụmụ okorobịa gị na ha so debere onwe ha ọcha, na-emetụghị nwanyị ahụ.”
1SA 21:5 Devid zara sị ya, “Nʼezie, anyị ekwebeghị ka ụmụ nwanyị bịa anyị nso, dịka anyị dị mbụ eme ma anyị na-eje ozi. Ndị ikom ndị a na-edo onwe ha nsọ ọ bụladị mgbe njem anyị na-adịghị nsọ ka ọfọdụzie njem nke taa.”
1SA 21:6 Ebe nri ọzọ na-adịghị, onye nchụaja ahụ nyere Devid achịcha nsọ, bụ achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị, nke ewepụtara site nʼihu Onyenwe anyị nʼime ebe ịchụ aja, debekwa achịcha ọhụrụ nke e ji gbanwee nke ochie dị nʼebe ahụ.
1SA 21:7 Ma otu onye odibo Sọl nọ nʼebe ahụ nʼụbọchị ahụ, onye e jigidere nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ Doeg, onye Edọm onyeisi ndị na-azụ anụ ụlọ Sọl.
1SA 21:8 Devid jụrụ Ahimelek ajụjụ sị ya, “I nweghị ùbe maọbụ mma agha nʼebe a? Ewetaghị m mma agha m maọbụ ngwa agha ọzọ, nʼihi na ozi eze ziri anyị dị oke ngwangwa.”
1SA 21:9 Onye nchụaja zaghachiri, “Mma agha Golaịat, onye Filistia, onye ahụ i tigburu na ndagwurugwu Ịla dị nʼebe a, a fụchiri ya nʼakwa nʼazụ efọọd. Ọ bụrụ na ị chọrọ ya, were ya, nʼihi na ọ dịghị mma agha ọzọ dị nʼebe a ma ọ bụghị nke ahụ.” Devid sịrị, “Ọ dịghị nke dịka ya, nye m ya.”
1SA 21:10 Nʼụbọchị ahụ, Devid gbapụrụ ọsọ site nʼebe Sọl nọ gbakwuru Akish eze ndị Gat.
1SA 21:11 Ma ndị ozi Akish sịrị ya, “Onye a ọ bụghị Devid, eze nke ala ahụ? Ọ bụghị ya bụ isi abụ ha na-abụ mgbe ha na-ete egwu na-asị: “ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, Devid egbukwaala iri puku kwụrụ puku ndị iro nke ya’?”
1SA 21:12 Mgbe Devid nụrụ okwu ndị a, ọ tụrụ egwu ihe Akish eze Gat ga-eme ya.
1SA 21:13 Nʼihi ya ọ gbanwere omume ya, bido ime dịka onyeisi na-adịghị mma. O bidokwara ịka akara nʼibo, bidokwa na-agụsasị ọnụ mmiri nʼahụọnụ ya.
1SA 21:14 Akish gwara ndị ozi ya okwu sị ha, “Leenụ nwoke a! Ọ bụ onyeisi mebiri! Gịnị mere unu ji kpọtara m ya?
1SA 21:15 Ndị na-ayị ara ha kọrọ m, nke mere unu ji kpọtara m nwoke a nʼebe a ka ọ bịa na-eme ka onye na-ayị ara nʼihu m? O kwesiri ka onye dị otu a bata nʼụlọ m?”
1SA 22:1 Devid hapụrụ Gat gbaba nʼọgba nkume Adulam. Mgbe ụmụnne ya ndị ikom na ndị ezinaụlọ nna ya nụrụ nke a, ha jekwuru ya nʼebe ahụ.
1SA 22:2 Ndị ọzọ malitekwara ịbịakwute ya nʼebe ahụ, ndị niile nọ na mkpagbu dị iche iche, ndị ji ụgwọ, na ndị ọchịchị Sọl na-adịghị mma. Ha niile jekwuru ya. Ọ dịghị anya Devid ghọọrọ onyendu ha. Ihe ruru narị mmadụ anọ so ya.
1SA 22:3 Devid sitere nʼebe ahụ jee Mizpa dị na Moab rịọọ eze obodo ahụ sị, “Biko, ị ga-ekwe ka nna m na nne m pụta bịa biri nʼetiti unu tutu ruo mgbe m matara ihe Chineke na-aga imere m?”
1SA 22:4 Ya mere, ọ hapụrụ ha ka ha nọdụ na nke eze Moab. Ha na ya nọgidere oge niile Devid bi nʼebe ahụ e wusiri ike.
1SA 22:5 Ma Gad onye amụma sịrị Devid, “Anọgidela nʼebe ahụ e wusiri ike, kama laghachi nʼala Juda.” Ya mere, Devid biliri gaa nʼoke ọhịa Heret.
1SA 22:6 Ugbu a Sọl nụrụ na achọtala ebe Devid na ndị ikom na-eso ya nọ. Sọl, onye ji ùbe ya nʼaka nọdụrụ ala nʼokpuru osisi tamarisk nke dị nʼugwu dị na Gibea. Ndị ozi ya guzokwa gburugburu ya.
1SA 22:7 Sọl gwara ha sị, “Geenụ ntị unu ndị ikom Benjamin! Ọ bụ unu niile ka nwa Jesi ga-enye ala ubi na ubi vaịnị? Ọ bụ unu niile ka ọ ga-eme ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha?
1SA 22:8 Ọ bụ ya mere unu ji dịnyere ya imegide m? Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu gwara m na nwa m na nwa Jesi gbara ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu ihe gbasara m na-emetụ nʼobi ịgwa m na nwa m nwoke akpaliela ohu m imegide m, ichebiri m nʼụzọ, dịka o mere nʼụbọchị taa.”
1SA 22:9 Ma Doeg onye Edọm, onye so ndị ozi Sọl guzo nʼebe ahụ kwuru sị, “Ahụrụ m mgbe nwa Jesi bịakwutere Ahimelek, nwa Ahitub na Nob.
1SA 22:10 Ahimelek jụtaara ya ase site nʼaka Onyenwe anyị, ma nyekwa ya ihe oriri na mma agha Golaịat onye Filistia.”
1SA 22:11 Mgbe ahụ, eze Sọl zipụrụ ozi nye Ahimelek nwa Ahitub na ndị ezinaụlọ nna ya niile, ndị bụ ndị nchụaja na Nob. Ha niile bịara guzo nʼihu eze.
1SA 22:12 Sọl gwara ha okwu sị, “Gee ntị, gị nwa Ahitub.” Ahimelek zara sị, “Ana m ege ntị, onyenwe m.”
1SA 22:13 Sọl jụrụ ya sị, “Gịnị mere gị na nwa Jesi ji gbaa izu imegide m? Gịnị mere i ji nye ya nri na mma agha, jụkwaara ya ase site nʼaka Chineke? Gịnị mere i ji na-agba ya ume ka o nupu isi nʼebe m nọ, na ka ọ bịakwa nʼebe a imegide m taa?”
1SA 22:14 Ahimelek zara eze sị, “Onye nʼetiti ndị ohu gị niile bụ onye kwesiri ntụkwasị obi dịka Devid, ọgọ eze, na onyeisi ndị agha na-eche gị nche; ọ bụkwa onye a na-enye nsọpụrụ dị ukwuu nʼezinaụlọ gị?
1SA 22:15 Nke a ọ bụ ụbọchị mbụ m na-ajụrụ ya ase nʼaka Chineke? Ọ bụghị! Ka eze ghara ibo ohu ya na ezinaụlọ nna m ebubo, nʼihi na ohu gị amaghị ihe ọbụla banyere okwu a niile.”
1SA 22:16 Ma eze kwuru sị, “Ị ga-anwụ. Ahimelek gị na ezinaụlọ nna gị niile!”
1SA 22:17 O nyere ndị na-eso ya iwu sị ha, “Gbuonụ ndị nchụaja ndị a, nʼihi na ha na Devid agbaala izuzu; ha makwa na o si nʼihu m na-agbapụ, ma ha agwaghị m!” Ma ndị agha eze jụrụ isetipụ aka ha megide ndị nchụaja Onyenwe anyị.
1SA 22:18 Mgbe ahụ eze nyere Doeg iwu sị ya, “Gị onwe gị, chigharịa gbuo ha.” Ya mere, Doeg onye Edọm chigharịrị tigbuo ha. Nʼụbọchị ahụ, o gburu iri ndị nchụaja asatọ na ise, ndị yi uwe akwa ọcha efọọd.
1SA 22:19 O ji mma agha jee Nob, obodo ndị nchụaja, gbuo ezinaụlọ ndị nchụaja niile, nwoke na nwanyị, na ụmụntakịrị, na ụmụ na-aṅụ ara. O gbukwara ehi na ịnyịnya ibu na atụrụ ha niile.
1SA 22:20 Otu nʼime ụmụ Ahimelek nwa Ahitub, aha ya bụ Abịata gbapụrụ, gbakwuru Devid.
1SA 22:21 Ọ gwara Devid na Sọl egbuola ndị nchụaja Onyenwe anyị.
1SA 22:22 Mgbe ahụ, Devid sịrị Abịata, “Nʼụbọchị ahụ, mgbe Doeg onye Edọm nọ nʼebe ahụ, amaara m na ọ ghaghị ịgwa Sọl. Mụ onwe m kpatara ọnwụ ndị niile nke ndị ezinaụlọ nna gị.
1SA 22:23 Soro m nọdụ nʼebe a, atụla ụjọ, nʼihi na onye na-achọ ndụ gị na-achọkwa ndụ nke m. Mmekpa ahụ ọbụla agaghị adakwasị gị ma mụ na gị nọdụ.”
1SA 23:1 Otu ụbọchị, ozi rutere Devid ntị na ndị Filistia na-ebuso ndị obodo Keila agha na-apụnara ha ihe niile ha nwere nke dị nʼebe ịzọcha ọka ha niile.
1SA 23:2 Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m jee buso ndị Filistia a agha?” Onyenwe anyị zara ya, “Gaa, buso ndị Filistia agha, zọpụta Keila.”
1SA 23:3 Ma ndị agha Devid sịrị ya, “Lee, anyị onwe anyị na-atụ egwu ihe a ga-eme anyị, ọ bụladị nʼime Juda, oleekwanụ otu anyị ga-esi jee buso ndị Filistia niile agha na Keila?”
1SA 23:4 Devid jụrụ Onyenwe anyị ọzọ, ma Onyenwe anyị zara ya nke ugboro abụọ sị, “Jee, rịdaruo Keila, nʼihi na aga m anọnyere gị; ị ga-emerikwa ndị Filistia.”
1SA 23:5 Ya mere, Devid na ndị agha ya gara Keila buso ndị Filistia agha. Ndị agha Devid gburu ọtụtụ ndị Filistia kpokọrọ igwe anụ ụlọ ha. Ha zọpụtakwara ndị Keila.
1SA 23:6 (Ugbu a, Abịata nwa Ahimelek chịkwa efọọd nʼaka gbadaa, mgbe ọ gbakwujere Devid na Keila).
1SA 23:7 Mgbe a gwara Sọl na Devid nọ na Keila, o kwuru sị, “Ahaa! Chineke enyefeela ya nʼaka m, nʼihi na Devid e jirila aka ya kee onwe ya agbụ site nʼịbanye nʼobodo nwere ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.”
1SA 23:8 Sọl chịkọtara ndị agha ya ịga Keila ịnọchibido Devid na ndị ikom ya.
1SA 23:9 Mgbe Devid nụrụ ihe Sọl na-achọ ime, ọ gwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Chịta efọọd ahụ.”
1SA 23:10 Devid sịrị, “O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, anụla m na Sọl na-achọ ịbịa laa Keila na obodo a nʼiyi nʼihi m nọ nʼebe a.
1SA 23:11 Ndị nwe Keila ha ga-arara m nye nʼaka Sọl? Ọ bụ ezie na Sọl na-abịa dịka m nụrụ? O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, biko gwa ohu gị.” Ma Onyenwe anyị sịrị, “Ọ ga-abịa.”
1SA 23:12 Ọzọkwa, Devid jụrụ sị, “Ndị nwe Keila ha ga-arara m na ndị ikom m nye nʼaka Sọl?” Onyenwe anyị sịrị, “Ha ga-eme otu a.”
1SA 23:13 Nʼihi ya, Devid na ndị ikom ya ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom isii, hapụrụ Keila pụọ na-awagharị site nʼotu ebe gaa nʼebe ọzọ. Mgbe Sọl nụrụ na Devid esitela na Keila pụọ, o jekwaghị ebe ahụ ọzọ.
1SA 23:14 Nʼoge a, Devid nọgidere nʼebe e wusiri ike dị nʼọzara, na nʼala ugwu ugwu nke ọzara Zif. Ụbọchị niile, Sọl chọgharịrị ya ma Chineke enyefeghị Devid nʼaka ya.
1SA 23:15 Mgbe Devid nọ na Horesh, nke dị nʼọzara Zif, ọ natara ozi na Sọl na-abịa igbu ya.
1SA 23:16 Jonatan, nwa Sọl pụrụ ịchọ Devid. Mgbe ọ hụrụ ya na Horesh, ọ gbara ya ume, nyere ya aka iguzosi ike nʼime Chineke.
1SA 23:17 Jonatan sịrị ya, “Atụla egwu, nna m Sọl apụghị ịchọta gị. Ị ga-abụ eze Izrel. Aga m abụkwa onye na-eso gị dịka Sọl nna m maara nke ọma.”
1SA 23:18 Ha abụọ gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Devid nọgidere na Horesh, ma Jonatan laghachiri nʼụlọ ya.
1SA 23:19 Ma ndị Zif biliri jekwuru Sọl na Gibea sị ya, “Devid o zoghị onwe ya nʼetiti anyị nʼọgba nkume dị nʼọhịa Horesh, nʼugwu Hakila, na ndịda Jeshimọn?
1SA 23:20 Ugbu a, eze anyị, bịa mgbe ọbụla ị chọrọ, ka anyị gaa jidere gị ya. Ị ga-emekwa ya dịka obi gị sị chọọ.”
1SA 23:21 Sọl zara ha sị, “Onyenwe anyị gọzie unu nʼihi mmetụta ọnọdụ m na-emetụta unu nʼobi.
1SA 23:22 Gaanụ chọpụta nke ọma ebe ọ na-ezo onwe ya, na onye hụrụ ya, nʼihi na agwara m na ọ bụ onye aghụghọ.
1SA 23:23 Chọpụtanụ ebe ọ na-ezo onwe ya ma lọghachikwanụ bịa gwa m ihe unu chọpụtara. Mgbe ahụ, aga m eso unu jee. Ọ bụrụ na ọ nọ nʼala ahụ, aga m achọpụta ya; e, aga m enyobanye anya chọọ ya nʼikwu niile nke Juda.”
1SA 23:24 Ha biliri buru Sọl ụzọ gawa Zif. Nʼoge a, Devid na ndị agha ya nọ nʼọzara Maon, nʼime Araba, na ndịda Jeshimọn.
1SA 23:25 Sọl na ndị agha ya bịarutere ebe ahụ malite chọwa Devid. Mgbe a gwara Devid na Sọl na-achọ ya, o duuru ndị agha ya gbada gaa nʼoke nkume ahụ ma nọgide nʼọzara Maon. Mgbe Sọl nụrụ nke a, ọ chụgidekwara Devid ọsọ gaa nʼebe ahụ.
1SA 23:26 Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, Sọl na ndị agha ya nọ nʼotu akụkụ ugwu ahụ, Devid na ndị agha ya nọkwa nʼakụkụ nke ọzọ, na-eme ngwa ka ha gbanarị Sọl. Ma Sọl na ndị agha ya na-abịa nnọọ nso ijide Devid.
1SA 23:27 Ma nʼotu mgbe ahụ, onyeozi bịakwutere Sọl sị ya, “Mee ngwangwa, lọta, nʼihi na ndị Filistia apụtala ibuso Izrel agha.”
1SA 23:28 Ngwangwa, Sọl sitere nʼịchụ Devid chigharịa azụ, lọta ibuso ndị Filistia agha. Site nʼoge ahụ, a kpọrọ ebe ahụ Devid nọ, Sela Hamahlekot, nke pụtara, Nkume Nkewa.
1SA 23:29 Devid si nʼebe ahụ pụọ gaa biri nʼebe e wusiri ike nke En-Gedi, ebe o zoro onwe ya.
1SA 24:1 Mgbe Sọl sitere nʼịlụso ndị Filistia agha lọta, a gwara ya sị, “Devid nọ nʼọzara En-Gedi.”
1SA 24:2 Sọl chịịrị puku ndị agha atọ a zụrụ nke ọma site nʼIzrel niile, pụọ ịchọ Devid na ndị ikom ya nʼetiti ọgba nkume, na nʼakụkụ ụzọ dị warawara nke Ewu Ọhịa.
1SA 24:3 Mgbe ọ bịaruru nso nʼọgba atụrụ nke dị nʼụzọ ahụ, otu ọgba nkume dị nʼebe ahụ, Sọl banyere nʼime ya, ịga mposi. Devid na ndị ikom ya nọ nʼime ime ọgba nkume ahụ.
1SA 24:4 Ndị ikom Devid sịrị ya, “Ahaa ugbu a bụ oge gị! Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenwe anyị kwuru okwu ya, mgbe ọ sịrị, ‘Aghaghị m inyefe gị onye iro gị nʼaka, ka i mee ya dịka o si masị gị.’ ” Ma Devid ji nwayọọ gaa nso ebe Sọl nọ bipụ ọnụ ọnụ uwe mwụda ya.
1SA 24:5 Emesịa, obi Devid malitere ịma ya ikpe nʼihi na o bipụrụ ọnụ ọnụ uwe mwụda Sọl.
1SA 24:6 Ọ gwara ndị ya na ha so okwu sị, “Onyenwe anyị ekwela na m ga-emeso nna m ukwu, onye Onyenwe anyị tere mmanụ mmeso dị otu ahụ, maọbụ na m ga-eweli aka imegide ya. Nʼihi na onye Onyenwe anyị tere mmanụ ka ọ bụ.”
1SA 24:7 Devid sitere nʼokwu ndị a o kwuru baara ndị so ya mba. O nyeghị ha ohere ibuso Sọl agha. Emesịa, Sọl hapụrụ ọgba nkume ahụ.
1SA 24:8 Mgbe Sọl si nʼọgba nkume ahụ pụọ ịga nʼihu nʼije ya, Devid sitere nʼime ọgba nkume ahụ pụta, kpọọ Sọl oku sị ya, “Onyenwe m, eze!” Sọl tụgharịrị ma Devid kpọrọ isiala nye ya, daa nʼala kpuo ihu ya nʼala.
1SA 24:9 Mgbe ahụ Devid gwara Sọl okwu sị, “Gịnị mere i ji na-aṅa ntị nʼokwu ndị mmadụ na-ekwu, ndị ahụ na-asị Devid na-achọ ụzọ ọ ga-esi merụọ gị ahụ?
1SA 24:10 Taa, i jirila anya gị hụ na ọ bụghị eziokwu. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m nʼime ọgba nkume ahụ ị banyere, ụfọdụ ndị mụ na ha so gwara m ka m gbuo gị, ma ahapụrụ m gị ndụ nʼihi na m sịrị, ‘Agaghị m eweli aka m megide nna m ukwu nʼihi na ọ bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’
1SA 24:11 Lee, nna m, lee iberibe uwe mwụda gị nʼaka m. Ebipụtara m ọnụ ọnụ uwe gị, ma egbughị m gị. Jiri nke a ghọta ma matakwa na ikpe nnupu isi na ajọ omume megide gị amaghị m. O nweghị ụzọ m si mejọọ gị, ma ị nọ na-achọsikwa m ike iwere ndụ m.
1SA 24:12 Ka Onyenwe anyị kpebie nʼetiti mụ na gị, ka Onyenwe anyị bọọ ọbọ ihe ọjọọ niile i mere. Ma agaghị m emetụ gị aka.
1SA 24:13 Dịka ilu ndị mgbe ochie si dị, ‘Ihe ọjọọ na-esi nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ,’ ma agaghị m emetụ gị aka.
1SA 24:14 “Ma onye kwanụ ka eze Izrel na-achọ ijide? Onye ka ọ na-atụfu oge ya ịchọgharị? Ọ bụ ozu nkịta? Ka ọ bụ akpị?
1SA 24:15 Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị, ya kpebiekwa okwu anyị. Ya leba okwu m anya kpepụta m, ya gosi na m bụ onye ikpe na-amaghị site nʼịnapụta m nʼaka gị.”
1SA 24:16 Mgbe Devid kwuchara okwu ndị a, Sọl zara sị ya, “Ọ bụ olu Devid nwa m dị nke ahụ?” Ọ malitekwara ịkwa akwa.
1SA 24:17 Ọ sịrị Devid, “Ị bụ ezi mmadụ karịa m, nʼihi na i jirila ezi omume kwụghachi m ajọ omume m.
1SA 24:18 E, i gosila m oke obi ebere taa, nʼihi na mgbe Onyenwe anyị nyefere m nʼaka gị, ị gbughị m.
1SA 24:19 Ebee ka onye ahụ nọ nʼụwa niile, nke pụrụ ịhapụ onye iro ya mgbe ọ mara nʼọnya ya? Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ezi ihe nʼihi obi ebere i gosiri m taa.
1SA 24:20 Ugbu a, amatala m na ị ghaghị ịbụ eze, ị ga-achịkwa alaeze Izrel.
1SA 24:21 Biko, ṅụọra m iyi nʼaha Onyenwe anyị na mgbe oge ahụ ruru, na ị gaghị egbu ụmụ m, maọbụ hichapụ aha m site nʼezinaụlọ nna m.”
1SA 24:22 Devid ṅụụrụ Sọl iyi. Emesịa, Sọl laghachiri nʼụlọ ya, ma Devid na ndị ikom ya laghachiri nʼọgba nkume ha.
1SA 25:1 Emesịa Samuel nwụrụ. Izrel niile chịkọtara onwe ha ọnụ zukọta ruo ụjụ nʼihi ọnwụ ya. Ha liri ya nʼụlọ ya dị na Rema. Emesịa, Devid gara nʼọzara Paran biri nʼebe ahụ.
1SA 25:2 Otu nwoke dị, onye obodo Maon, onye ikwu Kaleb, nke nwere akụnụba. O nwere igwe atụrụ dị puku atọ, na otu puku ewu, ndị ọ nọ nʼubi nʼoge a na-akpụchapụ ajị ha nʼobodo Kamel.
1SA 25:3 Aha nwoke a bụ Nebal. Nwunye ya kwa, onye bụ nwanyị mara mma, na onye nwere akọnuche, ka a na-akpọ Abigel. Nwoke a nwere omume ọjọọ; ọ kwara obi nʼazụ, afọ takwara ya mmiri.
1SA 25:4 Mgbe Devid nọ nʼọzara nụ na Nebal na-akpụcha ajị igwe ewu na atụrụ ya,
1SA 25:5 o zipụrụ ndị ikom iri sị ha. “Jekwurunụ Nebal nʼobodo Kamel, jụọ ya otu ihe si aga nʼaha m.
1SA 25:6 Sịnụ ya, ndụ gị, ndụ ogologo, udo na ahụ ike nye gị na ezinaụlọ gị, udo na ahụ ike nye ihe niile i nwere.
1SA 25:7 “ ‘Anụla m na ị na-akpacha ajị igwe ewu na atụrụ gị. Oge ndị ọzụzụ atụrụ gị nọ nʼetiti anyị, anyị emejọghị ha, o nweghị ihe ọbụla funarịrị ha oge ahụ niile ha nọrọ nʼobodo Kamel.
1SA 25:8 Jụọkwa ndị ikom gị, ha ga-agwa gị ma ihe m kwuru ọ bụ eziokwu. Ya mere gosi ụmụ okorobịa ndị a ihuọma, ebe ọ bụ na ha na-abịakwute gị nʼoge mmemme. Biko, nyetụ ndị ohu gị ndị a, na mụ bụ Devid nwa gị, ihe ọbụla aka gị ruru.’ ”
1SA 25:9 Ụmụ okorobịa Devid zipụrụ bịarutere zie Nebal ozi Devid ziri ha. Ha nọgidekwara chere ka onye ha ọsịsa.
1SA 25:10 Ma Nebal jụrụ ha sị, “Onye bụ Devid? Onye bụkwa nwa Jesi a? Ọtụtụ ndị ohu dị taa bụ ndị na-esi nʼaka nna ha ukwu na-agbapụ.
1SA 25:11 M ga-ewere achịcha m, na mmiri m, na anụ m gburu nʼihi ndị na-akpachara m ajị anụ nye ndị m na-amaghị ebe ha sị pụta?”
1SA 25:12 Ndị ikom Devid tụgharịrị azụ laghachi ebe ha si bịa. Mgbe ha bịarutere, ha kọrọ akụkọ banyere okwu niile Nebal kwuru.
1SA 25:13 Devid sịrị ndị ikom ya, “Onye ọbụla nyara mma agha!” Ha mere ihe o kwuru. Devid nʼonwe ya nyanyekwara mma agha nke ya. Ihe dị ka narị ndị ikom anọ sooro Devid pụọ, ebe narị mmadụ abụọ ndị ọzọ nọdụrụ na-eche ụlọ ha nche.
1SA 25:14 Ma otu nʼime ndị ikom Nebal gara kọọrọ Abigel, nwunye Nebal sị ya, “Lee, Devid esitela nʼọzara zite ndị ozi ka ha nye onyenwe anyị ekele ya, ma ọ kparịrị ha, baakwara ha mba.
1SA 25:15 Ma ndị ikom ndị a mesoro anyị mmeso ọma, ha emejọghị anyị. Oge ahụ niile anyị nọ ha nso nʼọhịa ọ dịghị ihe funarịrị anyị.
1SA 25:16 Ehihie na abalị, ha bụụrụ anyị mgbidi, ichebe anyị na atụrụ anyị, mgbe ha na-akpa nri nʼakụkụ ebe ha nọ.
1SA 25:17 Ọ dị mma ka ị mata ma marakwa ihe ị ga-eme ngwangwa; nʼihi nsogbu dị njọ nke na-aga ịdịrị nna anyị ukwu na ezinaụlọ ya niile. Nʼihi ọ bụ nwoke jọgburu onwe ya, na ọ dịghị onye pụrụ ịgwa ya okwu.”
1SA 25:18 Abigel mere ngwangwa chịkọta narị ogbe achịcha abụọ, karama akpụkpọ mmanya abụọ, atụrụ ise e doziri edozi, otu bushel ọka e ghere eghe, otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị achịcha fiig abụọ, bukwasị ihe ndị a niile nʼelu ịnyịnya ibu.
1SA 25:19 Ọ sịrị ụmụ okorobịa na-ejere ya ozi, “Na-aganụ nʼihu, ana m abịa nʼazụ.” Ma ọ gwaghị di ya Nebal ihe ọ na-aga ime.
1SA 25:20 Mgbe ọ nọ nʼelu ịnyịnya ibu na-agbada ụzọ nke ugwu ahụ ọ hụrụ Devid na ndị agha ya ka ha na-abịa. O zutere ha
1SA 25:21 ma Devid nọrịị na-ekwu na-asị, “Ọ bụ nʼefu ka anyị nyeere nwoke a aka. Anyị chebere igwe ewu na atụrụ ya nʼọzara; ọ dịkwaghị otu furu efu, ọ dịkwaghị otu nke e zuru ezu, ma o jirila ajọ omume kwụghachi m ihe ọma m meere ya.
1SA 25:22 Ka Chineke mesoo Devid mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ahapụ otu mkpụrụ nwoke ndụ nʼetiti ihe niile o nwere na-eku ume, mgbe chi echi bọrọ.”
1SA 25:23 Mgbe Abigel hụrụ Devid, o mere ngwangwa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịda, kpuo ihu nʼala, kpọọ isiala nye Devid.
1SA 25:24 Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, sị, “Ka ajọ omume ahụ dịkwasị nʼisi ohu gị, onyenwe m. Biko, kwere ka ohu gị gwa gị okwu, gekwaa ntị nʼihe ohu gị nwere ikwu.
1SA 25:25 Nebal bụ nwoke nwere obi ọjọọ, biko ka onyenwe m ghara ịgụ ihe ọbụla o kwuru nʼihe. Ọ bụ onye nzuzu, dịka aha ya na-egosi. Aha ya pụtara nzuzu, nzuzu na-esokwa ya. Ma ahụghị m ndị ozi ahụ i zitere, nʼezie ohu gị ahụghị ndị ikom onyenwe m zitere.
1SA 25:26 Ugbu a, onyenwe m, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ ma gị onwe gị na-adịkwa ndụ, ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbochiri gị ka ị ghara ịba nʼikpe ọmụma nke igbu mmadụ, na iji aka gị bọrọ onwe gị ọbọ, ka ndụ ndị iro gị na ndị niile na-achọ ime onyenwe m ihe ọjọọ, dịka Nebal.
1SA 25:27 Ma kwerekwa ka onyinye a, nke ohu gị nwanyị wetaara nna m ukwu, bụrụ nke a ga-enye ndị ikom na-eso gị.
1SA 25:28 “Biko, gbaghara njehie ohu gị nwanyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị aghaghị imere onyenwe m alaeze nke ga-adịgide, nʼihi na ọ bụ agha Onyenwe anyị ka ị na-alụ, agaghị ahụta ajọ omume nʼime gị ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
1SA 25:29 Ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ị na-achụ gị ịnapụ gị ndụ gị, ma ndụ onyenwe m ga-abụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị ga-ekechi na ngwungwu ndị dị ndụ. Ma ndụ ndị iro gị ka ọ ga-atụfu dịka nkume esi nʼakpa e ji efe ebe.
1SA 25:30 Mgbe Onyenwe anyị mezuru nye onyenwe m ihe ọma niile nke o kwere na nkwa, meekwa ya onyendu ndị Izrel,
1SA 25:31 onyenwe m agaghị enwe akọnuche nke ga na-esogbu ya nʼihi na o ji aka ya bọọrọ onwe ya ọbọ, maọbụ nke iwufu ọbara. Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị mere ka ihe gaara onyenwe m nke ọma, chetakwa ohu gị nwanyị.”
1SA 25:32 Devid zara Abigel sị ya, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel onye zitere gị taa ka ị bịa zute m.
1SA 25:33 Ka ngọzị dịrị gị nʼihi ezi uche gị, na nʼihi na i gbochiri m iwufu ọbara taa, gbochiekwa m iji aka m bọrọ onwe m ọbọ.
1SA 25:34 Ma ọ bụghị otu a, dịka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel na-adị ndụ, bụ onye jidere m site nʼimerụ gị ahụ, ọ bụrụ na ị pụtaghị ngwa izute m, ọ dịghị otu nwoke gaara adị ndụ nʼụlọ Nebal nʼìhè ụtụtụ echi.”
1SA 25:35 Devid naara ya ihe ndị ahụ niile o wetara sị ya, “Laghachi nʼụlọ gị nʼudo. Anụla m ihe i kwuru ma meekwa ihe ị rịọrọ.”
1SA 25:36 Mgbe Abigel batara nʼụlọ, o jekwuru Nebal ebe ọ nọ nʼoriri ọ kpọrọ, oriri dịka oriri a na-enwe nʼụlọeze. Ọ ṅụọkwala mmanya ṅụbigakwa ya oke; nʼihi ya ọ gwaghị ya ihe ọbụla tutu ruo nʼụtụtụ.
1SA 25:37 Nʼụtụtụ, mgbe mmanya pụrụ Nebal nʼanya, nwunye ya gwara ya ihe ndị a niile. Nke a mere ka obi ya nwụọ, ka ọ tọgbọrọ dịka nkume.
1SA 25:38 Mgbe abalị iri gafere, Onyenwe anyị tiri Nebal ihe otiti, nke mere ka ọ nwụọ.
1SA 25:39 Mgbe Devid nụrụ na Nebal anwụọla, ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye kpechitere m okwu m megide Nebal nʼihi nlelị anya o leliri m. O gbochiela ohu ya site nʼime ihe ezighị ezi, ma kwụghachi Nebal ụgwọ mmehie ya.” Mgbe ahụ Devid zigara ndị ozi ka ha gaa jụọ Abigel ma ọ ga-ekwe ị ghọọ nwunye ya.
1SA 25:40 Ndị ozi Devid bịakwutere Abigel na Kamel zie ya ozi sị, “Devid zitere anyị bịakwute gị ịlụta gị ka ị ghọọ nwunye ya.”
1SA 25:41 Abigel kpuru ihu nʼala sị ya, “Lee ohu gị nwanyị, ejikeere m ijere gị ozi, na ịsacha ụkwụ ndị na-ejere onyenwe m ozi.”
1SA 25:42 Abigel mere ngwangwa jikere, kpọrọ ụmụ agbọghọ ise na-ejere ya ozi, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, soro ndị ahụ Devid zitere lakwuru Devid. Otu a ka Abigel sị ghọọ nwunye Devid.
1SA 25:43 Devid lụkwara nwanyị ọzọ aha ya bụ Ahinoam, onye Jezril. Ha abụọ bụkwa ndị nwunye ya.
1SA 25:44 Nʼoge a, Sọl ewerela nwa ya nwanyị Mikal, onye bụ nwunye Devid kpọnye Palti, nwa Laish, onye obodo Galim, dịka nwunye.
1SA 26:1 Ndị Zif jekwuru Sọl na Gibea gwa ya na Devid na-ezo onwe ya nʼugwu Hakila nke chere ihu nʼọzara.
1SA 26:2 Nʼihi ya, Sọl biliri chịrị puku ndị agha atọ o leziri anya họpụta nʼetiti ndị agha Izrel, duru ha gaa nʼọzara Zif ịchọ Devid.
1SA 26:3 Sọl mara ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ụzọ ugwu nta Hakila na ncherita ihu Jeshimọn nke nọ nʼokporoụzọ. Ma ka Devid nʼonwe ya nọ nʼime ọzara, ọ hụrụ na Sọl chụụrụ ya bata nʼime ọzara,
1SA 26:4 Devid zipụrụ ndị nledo, matakwa na Sọl bịara nʼezie.
1SA 26:5 Emesịa, Devid pụrụ jeruo ebe Sọl mara ụlọ ikwu ya. Ọ hụrụ ebe Sọl na Abna nwa Nea, onyeisi agha dinara ala. Sọl dina nʼime ogige ụlọ ikwu ahụ, ndị agha ya dinakwara gburugburu ya.
1SA 26:6 Devid sịrị Ahimelek onye Het, na Abishai, nwa Zeruaya onye bụ nwanne Joab, “Onye ga-eso m gaa nʼogige ebe Sọl na ndị agha ya mara ụlọ ikwu ha?” Abishai zara sị, “Aga m eso gị gaa.”
1SA 26:7 Ya mere, nʼabalị, Devid na Abishai jiri nwayọọ jeruo ebe ndị agha Sọl mara ụlọ ikwu ha. Ha hụrụ Sọl ebe o dinara ala na-arahụ ụra. Ùbe ya ka ọ manyekwara nʼala nʼakụkụ ebe isi ya dị. Abna, na ndị agha ndị ọzọ dina gburugburu Sọl na-arahụ ụra.
1SA 26:8 Abishai sịrị Devid, “Nʼezie, Chineke enyefeela gị onye iro gị nʼaka taa. Ugbu a, kwere ka m gaa were ùbe magide ya nʼala otu ugboro; agaghị m atụ ya ugboro abụọ.”
1SA 26:9 Ma Devid sịrị Abishai, “Mba egbula ya. Onye ga-eseti aka ya megide onye Onyenwe anyị tere mmanụ, ghara ị bụ onye ikpe na-amaghị?”
1SA 26:10 Ọ sịrị, “Nʼezie dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ọ bụ Onyenwe anyị ya onwe ya ga-etida ya, maọbụ oge ya ga-eru mgbe ọ ga-anwụ, ma ọ bụkwanụ ọ gaa agha, ọ nwụfuo.
1SA 26:11 Ma Onyenwe anyị ekwela ka m setịpụ aka megide onye Onyenwe anyị tere mmanụ. Ugbu a, weta ùbe na ihe ịṅụ mmiri nke dị nʼakụkụ isi ya, ka anyị si nʼebe a pụọ.”
1SA 26:12 Devid weere ùbe ya na ite mmiri dị nʼakụkụ isi Sọl, ha sitere nʼebe ahụ pụọ. Ọ dịkwaghị onye hụrụ ha. Ọ dịkwaghị onye tetara, nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ha daba nʼoke ụra.
1SA 26:13 Mgbe ahụ, Devid pụrụ gafee nʼofe nke ọzọ, guzo onwe ya nʼelu ugwu ebe dị anya, ebe mbara dị nʼetiti ya na ha.
1SA 26:14 Devid kpọrọ Abna nwa Nea na ndị agha oku sị, “Abna, za m oku!” Abna jụrụ ya sị, “Onye ka ị bụ i ji si otu a na-eti mkpu ịkpọte eze?”
1SA 26:15 Devid sịrị, “Nʼezie, ọ bụghị nwoke ka ị bụ? Onye dịkwa ka gị nʼIzrel niile? Gịnị mere i ji hapụ ichezi onyenwe gị eze nke ọma? Otu onye bịara igbu onyenwe gị, bụ eze.
1SA 26:16 Ihe a i mere adịghị mma. Nʼeziokwu, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, gị na ndị ikom gị kwesiri ọnwụ, nʼihi na gị na ndị gị echebeghị onyenwe unu, bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ. Ebee ka ùbe eze, na ihe mmiri ọṅụṅụ ya, nke dị nʼakụkụ isi ya dị?”
1SA 26:17 Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ olu Devid, ọ sịrị, “Ọ bụ gị nwa m, Devid?” Devid zara sị ya, “E, ọ bụ olu m, onyenwe m, eze.”
1SA 26:18 Ọ sịkwa, “Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achụgharị ohu ya? Gịnị ka m mere? Gịnịkwa bụ ihe ọjọọ ị chọtara nʼaka m?
1SA 26:19 Ugbu a ka onyenwe m eze gee ntị nʼokwu ohu ya: Ọ bụrụ na Onyenwe anyị kpaliri gị imegide m, mgbe ahụ arịrịọ m bụ ka Onyenwe anyị nara onyinye ịnata ihuọma. Otu ọ dị, a si na ọ bụ ndị mmadụ na-akpali gị imegide m, ka ndị dị otu a bụrụ ndị a bụrụ ọnụ nʼihu Onyenwe anyị. Nʼihi na ha esitela nʼoke m nwere nʼihe nketa Onyenwe anyị chụpụ m, sị m, ‘Gaa fee chi ndị ọzọ ofufe.’
1SA 26:20 Ugbu a, ekwela ka ọbara m bụrụ ihe a wufuru nʼala dị anya, na-abụghị nʼihu Onyenwe anyị. Eze Izrel apụtala ịchọ akpị dịka m, otu dinta si achọgharị ọkwa nʼelu ugwu.”
1SA 26:21 Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Emehiela m. Lọghachi nʼụlọ nwa m Devid. Nʼihi na ị gụrụ ndụ m taa dịka ihe dị oke ọnụahịa. Agaghị m emejọ gị ọzọ. Nʼezie, a kpaala m agwa dịka onye nzuzu, meekwa ihe nke ukwuu na-amaghị ama.”
1SA 26:22 Devid zara ya sị, “Lee ùbe eze, Zie otu nʼime ndị ikom gị ka ọ bịa were ya.
1SA 26:23 Onyenwe anyị na-akwụghachi nwoke ọbụla ezi omume ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m taa ma ajụla m igbu onye ya o tere mmanụ.
1SA 26:24 Ugbu a, ka Onyenwe anyị zọpụta ndụ m, ọ bụladị dịka m sị zọpụta ndụ nke gị taa. Ka ọ napụtakwa m site na mkpagbu m niile.”
1SA 26:25 Sọl sịrị Devid, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nwa m, Devid. Ị ga-eme oke ihe, bụrụkwa onye na-emeri nʼagha.” Devid sitere nʼebe ahụ pụọ. Sọl laghachikwara nʼụlọ ya.
1SA 27:1 Devid chere nʼime onwe ya sị, “Otu ụbọchị Sọl ga-enweta m, bibie m. Ihe ka mma m ga-eme bụ ịgbaga nʼala ndị Filistia. Nke a ga-eme ka Sọl kwụsị ịchọgharị m ebe ọbụla nʼIzrel. Aga m esikwa otu a, nwere onwe m site nʼaka ya.”
1SA 27:2 Ya mere, Devid na narị ndị ikom isii ya, na ezinaụlọ ha, biliri jekwuru Akish nwa Maok, eze ndị Gat.
1SA 27:3 Devid na ndị agha ya sooro Akish biri na Gat. Onye ọbụla du ezinaụlọ ya. Devid nʼonwe ya du ndị inyom abụọ ya: Ahinoam onye Jezril, na Abigel onye Kamel, nwunye ochie Nebal.
1SA 27:4 Ọ dịghị anya, Sọl nụrụ na Devid agbalaala Gat, nʼihi ya ọ kwụsịrị ịchụso ya.
1SA 27:5 Devid gwara Akish sị ya, “Ọ bụrụ na m anatala amara nʼebe ị nọ, ọ ga-adị mma ka enye m otu obodo nʼime obodo nke ala a, ka m biri. Nʼihi gịnị ka ohu gị ga-eji soro gị biri nʼobodo eze?”
1SA 27:6 Akish nyere ya Ziklag, nʼihi ya, Ziklag bụ obodo ndị eze Juda ruo taa.
1SA 27:7 Devid biri nʼoke ala ndị Filistia otu afọ na ọnwa anọ.
1SA 27:8 Devid na ndị ikom ya nọgidere oge ahụ niile na-emegide ndị Geshua, ndị Gizi na ndị Amalek. (Site na mgbe ochie ndị a bi nʼala ahụ gbatịrị ruo Shua na Ijipt)
1SA 27:9 Mgbe ọbụla Devid wakporo akụkụ ọbụla, ọ dịghị ahapụ nwoke maọbụ nwanyị ndụ. Ma ọ na-akpụrụ atụrụ ha, na ehi ha, na ịnyịnya ibu ha, na ịnyịnya kamel ha, nakwa uwe ha. Emesịa, ọ na-alọghachikwuru Akish.
1SA 27:10 Ọ bụrụ na Akish ajụọ Devid ajụjụ sị, “Ndị ole ka unu busoro agha taa?” Devid ga-aza sị, “Ọ bụ ndị bi na ndịda Juda”, maọbụ “ndị ndịda Jerahmel”, maọbụ “ndị ndịda Ken.”
1SA 27:11 Ma ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị onye ọ hapụrụ ndụ, nke a ga-akpọta na Gat, nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ha nwere ike ịbịa kwuo megide anyị, sị, ‘Otu a ka Devid mere.’ ” Otu a ka ọ na-emekwa ọtụtụ oge ahụ niile o bi nʼetiti ndị Filistia.
1SA 27:12 Akish kwenyere Devid, kwuo nʼobi ya sị, “Devid abụrụla ihe a kpọrọ asị nʼebe ndị nke ya bụ ndị Izrel nọ. Ọ ga-abụkwara m ohu ruo mgbe niile.”
1SA 28:1 Nʼoge ahụ, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha jikere ịlụso ndị Izrel agha. Akish eze Gat gwara Devid okwu, “Ghọtakwa na gị na ndị agha gị ga-eso mụ na ndị agha m gaa ibu agha.”
1SA 28:2 Devid zara ya sị, “Ị ga-eji anya gị hụrụ ihe ohu gị ga-eme.” Akish zara sị, “Ọ dị mma aga m eme gị onye nche m ụbọchị ndụ gị niile.”
1SA 28:3 Nʼoge a Samuel anwụọla, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, lie ya nʼobodo ya bụ Rema. Sọl achụpụsịakwala ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase na ndị dibịa afa site nʼala ahụ.
1SA 28:4 Ndị Filistia zukọtara, bịa maa ụlọ ikwu ha na Shunem, ebe Sọl na ndị Izrel niile zukọtakwara maa ụlọ ikwu ha na Gilboa.
1SA 28:5 Mgbe Sọl hụrụ igwe ndị agha ndị Filistia, oke ụjọ jidere ya.
1SA 28:6 Ọ jụrụ Onyenwe anyị ase, ma Onyenwe anyị azaghị ya. Ọ zaghị na nrọ, maọbụ site nʼUrim, maọbụ site nʼọnụ ndị amụma.
1SA 28:7 Mgbe ahụ, Sọl sịrị ndị na-ejere ya ozi, “Chọtara m nwanyị onye na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, ka m gakwuru ya jụta ya ase.” Ha sịrị, “E nwere otu nwanyị dị otu a nʼEndoa.”
1SA 28:8 Ya mere, Sọl nwogharịrị onwe ya, yiri uwe ọzọ, o ruo nʼabalị, ya na ndị ikom abụọ gakwuru nwanyị ahụ. Ọ sịrị, “Jụtara m mmụọ ase, kpọlitekwara m onye m ga-akpọ aha ya.”
1SA 28:9 Ma nwanyị ahụ sịrị ya, “Nʼezie gị onwe gị maara ihe Sọl mere. Ọ kwụsịla ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, na ndị dibịa afa site nʼala a. Nʼihi gịnị ka iji a gbara ndụ m ọnya, ime ka m nwụọ?”
1SA 28:10 Ma Sọl jiri Onyenwe anyị ṅụọra ya iyi, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị ata gị ahụhụ nʼihi ihe a.”
1SA 28:11 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ jụrụ, “Onye ka ị chọrọ ka m mee ka ọ rịgokwute gị?” Sọl sịrị, “Mee ka Samuel rịgokwute m.”
1SA 28:12 Mgbe nwanyị ahụ hụrụ Samuel, o tiri mkpu sị, “Gịnị mere iji ghọgbuo m? Gị onwe gị bụ Sọl!”
1SA 28:13 Eze sịrị ya, “Atụla egwu! Gịnị ka ị na-ahụ?” Nwanyị ahụ sịrị, “A hụrụ m chi ka o si nʼala na-arịgopụta.”
1SA 28:14 Sọl jụrụ, “Gịnị ka onye ahụ yiri nʼọdịdị?” Ọ sịrị, “Ọ bụ agadi nwoke na-arịgota, e ji uwe mwụda kpuchie ahụ ya.” Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ Samuel. O kpuru ihu nʼala, kpọọkwa isiala.
1SA 28:15 Samuel sịrị Sọl, “Gịnị mere i ji esogbu m, site na ịkpọlite m?” Sọl zara, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ndị Filistia na-ebuso m agha, ma Chineke esitekwala nʼebe m nọ wezuga onwe ya. Ọ naghị azakwa m ọzọ, maọbụ site na ndị amụma, maọbụ site na nrọ. Nʼihi ya ka m ji kpọọ gị, ịjụ gị ihe m ga-eme.”
1SA 28:16 Samuel sịrị, “Nʼihi gịnị ka i ji na-ajụ m, ebe ọ bụ na Onyenwe anyị ewezugala onwe ya site nʼebe ị nọ, ghọọkwara gị onye iro?
1SA 28:17 Onyenwe anyị emeela ihe ọ sị na ọ ga-eme. Ọ napụla gị alaeze gị were ya nye Devid.
1SA 28:18 Ihe ndị a niile na-aga ịdakwasị gị nʼihi na i geghị ntị na ndụmọdụ Onyenwe anyị, mgbe o were iwe dị ọkụ megide ndị Amalek.
1SA 28:19 Onyenwe anyị ga-arara gị na ndị Izrel nyefee nʼaka ndị Filistia, echi gị na ụmụ gị ndị ikom ga-abịa nọnyeere m nʼebe a. Onyenwe anyị ga-ararakwa ndị agha Izrel nye nʼaka ndị Filistia.”
1SA 28:20 Ngwangwa, Sọl dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼoke egwu, nʼihi okwu ndị a niile Samuel kwuru. Ike adịghịkwa nʼime ya nʼihi agụụ, ebe ọ bụ na o ribeghị nri ọbụla ụbọchị ahụ niile.
1SA 28:21 Mgbe nwanyị a hụrụ ọnọdụ Sọl, ọ gwara ya okwu sị ya, “Onyenwe m, lee, ohu gị rubere isi mee ihe ị sị m mee. Ọ bụkwa ndụ m ka m ji chụọ aja imezu ihe ị rịọrọ m.
1SA 28:22 Ugbu a, biko, gee ntị nʼihe ohu gị na-aga ịgwa gị. Kwere ka m nye gị nri ka i rie, ka i nweta ike ị ga-eji laghachi.”
1SA 28:23 Ma Sọl jụrụ iri nri ọbụla. Ma ndị ikom ya na ha so malitere ịrịọ ya tutu ruo mgbe o kwenyere bilie, nọdụ ala nʼelu ihe ndina.
1SA 28:24 Nwanyị ahụ mere ngwangwa gbuo nwa ehi gbara abụba o nwere nʼụlọ ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha nke etinyeghị ihe na-eko achịcha nʼime ya,
1SA 28:25 O doziri nri nʼihu Sọl na ndị ikom ya. Ha rikwara ya. Ha biliri laa nʼabalị ahụ.
1SA 29:1 Ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha bịaruo Afek, ma ndị agha Izrel zukọtara nʼakụkụ isi iyi Jezril.
1SA 29:2 Mgbe ndịisi agha ndị Filistia malitere ịgafesị ha na ndị agha ha, ụfọdụ nʼime ha du ọtụtụ narị ndị agha, ụfọdụ, ọtụtụ puku ndị agha, Devid na ndị agha ya so nʼazụ, ha na Akish, eze ndị Filistia.
1SA 29:3 Ndịisi agha ndị Filistia jụrụ eze Akish ajụjụ sị, “Gịnị ka ndị Hibru ndị a na-eme nʼebe a?” Akish gwara ha sị, “Onye a ọ bụghị Devid, onyeozi si nʼaka Sọl eze ndị Izrel gbapụ? Mụ na ya ebiela ihe karịrị otu afọ, ma achọpụtaghị ihe ọbụla dị njọ nʼebe ọ nọ, site nʼụbọchị ahụ ọ hapụrụ Sọl ruo ugbu a.”
1SA 29:4 Ma ndịisi agha ndị Filistia were iwe megide ya. Ha sịrị ya, “Zilaga nwoke a, ka ọ laghachi nʼọnọdụ ozi ebe i mere ya onye nlekọta. Anyị na ha agaghị eso jee nʼihu ọgụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-atụgharịa megide anyị nʼagha. Olee ụzọ ọzọ ọ ga-esi mee ka ya na nna ya ukwu dị na mma ma ọ bụghị site nʼigbu ndị agha anyị ndị a?”
1SA 29:5 Onye a ọ bụghị Devid ahụ ndị inyom Izrel ji gụọ egwu sị, “ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị iro’?”
1SA 29:6 Ya mere, Akish kpọrọ Devid sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ị bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. Ọ gaara atọ m ụtọ ka ị soro m buo agha. Site na mgbe ị bịakwutere m tutu ruo ugbu a, o nweghị mmejọ ọbụla m chọpụtara nʼime gị. Ma ndịisi anyị anabataghị gị.
1SA 29:7 Ugbu a, laghachinụ azụ, laa nʼudo. Unu emeela ihe ọbụla ga-akpasu ndịisi ndị Filistia iwe.”
1SA 29:8 Devid jụrụ Akish, “Ma gịnị ka m mere? Gịnịkwa ka ị hụtara megide ohu gị site nʼụbọchị m bịakwutere gị ruo taa? Gịnị ga-eme ka m ghara ịlụso ndị iro onyenwe m, bụ eze agha?”
1SA 29:9 Akish zaghachiri, “Ama m nʼonye dị mma ka ị bụ nʼanya m, dịka mmụọ ozi nke Chineke. Nʼagbanyeghị nke a, ọchịagha ndị Filistia asịla, ‘Ọ gaghị eso anyị jee nʼagha.’
1SA 29:10 Ya mere, bilie nʼisi ụtụtụ, gị na ndị ọrụ onyenwe gị ndị soro gị bịa, bilienụ nʼisi ụtụtụ laghachi mgbe ìhè dịrị unu.”
1SA 29:11 Devid na ndị ikom na-eso ya biliri nʼisi ụtụtụ ịlaghachi nʼala ndị Filistia. Ma ndị agha ndị Filistia gara nʼihu jeruo Jezril.
1SA 30:1 Mgbe Devid na ndị ikom ya rutere obodo Ziklag nʼụbọchị nke atọ, ha hụrụ na ndị Amalek abịala wakporo bi nʼakụkụ ndịda Negev na Ziklag. Ha buru agha megide Ziklag, gbaa obodo ahụ ọkụ,
1SA 30:2 dọtakwa ndị inyom na ndị niile bi nʼime ya nʼagha, ma okenye ma ụmụntakịrị. Ha egbughị ha egbu, kama ha buuru ha laa.
1SA 30:3 Mgbe Devid na ndị ikom ya ruru Ziklag, ha hụrụ na-esuola ya ọkụ, dọkpụrụ ndị inyom ha, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼagha.
1SA 30:4 Ya mere, Devid na ndị ikom ya kwara akwa ruo mgbe ike akwa gwụrụ ha.
1SA 30:5 Ndị inyom abụọ Devid, Ahinoam onye Jezril na Abigel, nwunye ochie Nebal onye Kamel, sokwa na ndị a dọtara nʼagha ahụ.
1SA 30:6 Ihe a wetaara Devid oke nsogbu, nʼihi na ndị ikom ya nọ na-ekwu okwu iji nkume tugbuo ya; ha niile nọ nʼobi ilu nʼihi ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Ma Devid chọtara ike nʼime Onyenwe anyị Chineke ya.
1SA 30:7 Devid sịrị Abịata, bụ onye nchụaja, nwa Ahimelek, “Chịtara m efọọd ahụ.” Ya mere, Abịata chịtara ya nye ya
1SA 30:8 Mgbe ahụ, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m chụso ndị a na-apụnara ndị mmadụ ihe? Ọ bụrụ na m achụso ha, aga m ejide ha?” Onyenwe anyị zara, “E, chụso ha ọsọ, ị ga-achụkwute ha, ma nataghachikwa ihe niile ha were.”
1SA 30:9 Mgbe ahụ, Devid na narị ndị agha isii ya bịarutere nʼọdọ mmiri Beso, ebe ha hapụrụ ụfọdụ ndị
1SA 30:10 narị ndị ikom abụọ nʼime ha enwekwaghị ike ịgafe ndagwurugwu Beso nʼihi ike ọgwụgwụ, ma Devid na narị anọ ndị ọzọ chụsoro ha.
1SA 30:11 Ha hụrụ otu nwokorobịa onye Ijipt nʼọhịa, duuru ya bịakwute Devid. Ha nyere ya mmiri ka ọ ṅụọ, nyekwa ya nri ka o rie.
1SA 30:12 Ihe ha nyere ya bụ achịcha fiig, na ụyọkọ mkpụrụ vaịnị abụọ nke a mịkpọrọ amịkpọ. Mgbe o richara ha, o nweghachiri onwe ya, nʼihi na o ribeghị nri ọbụla, maọbụ ṅụọ mmiri ọbụla ụbọchị atọ, ehihie na nʼabalị.
1SA 30:13 Mgbe ahụ, Devid jụrụ ya sị, “Ị bụ onye? Ebeekwa ka i si bịa?” Ọ zara Devid sị, “Abụ m onye Ijipt, bụrụkwa ohu onye Amalek. Onyenwe m hapụrụ m nʼebe a abalị atọ gara aga nʼihi na ahụ adịghị m ike.
1SA 30:14 Anyị si obodo ebe anyị gara lụọ agha na-alọghachi mgbe ha hapụrụ m nʼebe a. Anyị gara lụgbuo obodo ndị Keret, nke dị nʼime Negeb, na obodo dị na ndịda ala Juda na ala Kaleb. Anyị gbakwara obodo Ziklag ọkụ.”
1SA 30:15 Devid jụrụ ya sị, “I nwere ike duru m gaa ebe ha nọ.” Nwokorobịa ahụ zara ya sị, “Ọ bụrụ na ị ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke na ị gaghị egbu m maọbụ were m nyeghachi onyenwe m, aga m eduru gị gaa ebe ha nọ.”
1SA 30:16 O duuru ha jee nʼebe ndị Amalek nọ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ ha ebe ha tụsara onwe ha nʼala na-eri na-aṅụ, na-etekwa egwu ọṅụ, nʼihi ihe dị ukwuu ha kwatara nʼagha site nʼala ndị Filistia, na nʼala Juda.
1SA 30:17 Devid na ndị agha ya bịakwasịrị ha na mberede gbuo ha site nʼabalị ahụ ruo anyasị echi ya. Ọ dịkwaghị otu nwoke nʼime ha fọdụrụ ndụ ma ọ bụghị narị ndị ikom anọ makwasịrị nʼelu ịnyịnya kamel ha gbalaga.
1SA 30:18 Devid nwetaghachiri ihe niile ndị Amalek kwatara nʼagha, tinyere ndị inyom ya abụọ.
1SA 30:19 O nweghị ihe furu efu, ma nke ukwu ma nke nta, ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ihe a kwatara nʼagha, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ndị Amalek dọtara nʼagha. Devid nwetaghachiri ihe niile.
1SA 30:20 Ọzọkwa, Devid chịkọtara igwe ehi na igwe ewu na atụrụ. Ndị ikom ya chịịrị ha, tinyere anụ ụlọ ndị ọzọ, na-aga, na-asị, “Ndị a bụ ihe Devid kwatara nʼagha.”
1SA 30:21 Emesịa, Devid bịarutere ebe narị ndị ikom abụọ ndị ahụ nọ na Ndagwurugwu Beso. Ndị a bụ ndị ahụ na-enweghị ike iso Devid nʼihi na ike gwụrụ ha. Ha pụtara zute Devid na ndị so ya. Mgbe Devid na ndị ikom ya bịara ha nso, ọ jụrụ ha otu ha mere.
1SA 30:22 Ma ndị ikom ọjọọ ahụ niile, na ndị okwu na ụka nọ nʼetiti ndị na-eso Devid sịrị, “Nʼihi na ndị a esoghị anyị jee, ya mere ha agaghị eso anyị keta ihe ndị a anyị kwatara nʼagha. Nyeghachi ha naanị nwunye ha na ụmụ ha; gwakwa ha ka ha laa.”
1SA 30:23 Ma Devid sịrị, “Mba, ụmụnna m, unu ekwesighị isi otu a kee ihe ndị ahụ Onyenwe anyị nyere anyị. O chebere anyị, nyefee nʼaka anyị ndị agha ahụ niile bịara imegide anyị.
1SA 30:24 Unu chere na ọ dị onye ga-ege unu ntị mgbe unu na-ekwu okwu dị otu a? Anyị niile ga-eketa oke; oke ndị jere agha na ndị chebere ihe anyị ga-abụ otu.”
1SA 30:25 Site nʼụbọchị ahụ, Devid mere ka nke a bụrụ iwu nye ndị Izrel niile ruo taa.
1SA 30:26 Mgbe ha rutere Ziklag, Devid weere ụfọdụ ihe ha kwatara nʼagha zigara ndị okenye Juda, ndị bụ ndị enyi ya, na-asị, “Lee onyinye ewetaara unu site nʼụfọdụ nʼime ihe anyị kwatara site nʼaka ndị iro Onyenwe anyị.”
1SA 30:27 O zigara ha nye ndị bi na Betel, Ramọt Negev na Jatịa,
1SA 30:28 nyekwa ndị nọ Aroea, Sifmot, Eshtemoa
1SA 30:29 na Rakal, nyekwa ndị bi nʼobodo ndị Jerameel na nke ndị Ken,
1SA 30:30 nyekwa ndị bi na Homa, Bo Ashan, Atak
1SA 30:31 na Hebrọn na ndị nọ nʼebe niile ndị ahụ ebe Devid na ndị ya wagharịrị.
1SA 31:1 Nʼoge a, ndị Filistia lụsoro ndị Izrel agha, ndị Izrel si nʼihu ha gbaa ọsọ, ma ọtụtụ nʼime ha nwụrụ nʼugwu Gilboa.
1SA 31:2 Ndị Filistia ji ike chụso Sọl na ụmụ ya. Ha gburu ụmụ ya ndị ikom, Jonatan, Abinadab na Malkishua.
1SA 31:3 Agha ahụ siri ike nke ukwuu megide Sọl, mgbe ndị na-agba ụta chụkwutere ya ha merụrụ ya ahụ nʼebe ọ dị ukwuu.
1SA 31:4 Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya.
1SA 31:5 Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, soro Sọl nwụọ.
1SA 31:6 Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ, onye na-ebu ihe agha ya na ndị agha ya niile, nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ.
1SA 31:7 Mgbe ndị Izrel nọ nʼofe ọzọ nke ndagwurugwu, na ndị nọ nʼofe Jọdan, hụrụ na ndị agha Izrel agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha.
1SA 31:8 Nʼechi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom atọ ka ha tọgbọ nʼugwu Gilboa.
1SA 31:9 Ha bipụrụ Sọl isi, yipụkwa ya ihe agha ya. Ha zipụkwara ndị ozi gara nʼala ndị Filistia niile ikwusa akụkọ ihe mere nʼụlọ arụsị ha nakwa nʼetiti ndị ha niile.
1SA 31:10 Ha tinyere ihe agha Sọl nʼụlọ Ashtọret, kpọgidekwa ozu ya nʼaja ụlọ mgbidi obodo Bet-Shan.
1SA 31:11 Mgbe ndị obodo Jebesh Gilead nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl,
1SA 31:12 ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, gara njem ogologo abalị ahụ niile jeruo Bet-Shan. Ha sitere nʼelu mgbidi obodo Bet-Shan tọda ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom buru ha laa Jebesh ebe ha nọ kpọọ ozu ha ọkụ.
1SA 31:13 Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi Tamarisk dị na Jebesh, buo ọnụ ụbọchị asaa.
2SA 1:1 Mgbe Sọl nwụsịrị, Devid si ebe ọ gara tigbuo ndị Amalek lọghachi. Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag.
2SA 1:2 O ruo, nʼụbọchị nke atọ, otu nwoke si nʼọmụma ụlọ ikwu Sọl bịakwutere ya. Uwe nwoke a yi nʼahụ dọwara adọwa. Isi ya dịkwa aja aja. Ọ batara daa nʼala nʼihu Devid nʼọnọdụ inye ya nsọpụrụ.
2SA 1:3 Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?” Nwoke ahụ zara sị, “Esi m nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel gbapụta.”
2SA 1:4 Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.” Nwoke ahụ zara sị, “Ndị agha Izrel niile agbaala ọsọ. Ọtụtụ nʼime ndị agha Izrel anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya nwụkwara!”
2SA 1:5 Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?”
2SA 1:6 Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike.
2SA 1:7 Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’
2SA 1:8 “Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’ “Azara m ya sị, ‘Abụ m onye Amalek.’
2SA 1:9 “Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’
2SA 1:10 “Ya mere, eguzoro m nʼakụkụ ya, gbuo ya, nʼihi na amaara m na ọ gaghị adị ndụ tee anya. Ọ bụkwa mgbe m gbusịrị ya ka m kpupụrụ ya okpueze dị ya nʼisi, gbapụtakwa ya mgbaaka dị nʼogwe aka ya, chịrị ha, ka m chịtara gị ha, onyenwe m.”
2SA 1:11 Mgbe Devid na ndị ikom ya nụrụ ihe ndị a. Ha dọwara uwe ha.
2SA 1:12 Ha ruru ụjụ. Kwaa akwa. Bukwaa ọnụ ruo oge anyasị nʼihi Sọl na Jonatan nwa ya nwoke, na nʼihi ndị agha Onyenwe anyị na ụlọ Izrel. Nʼihi na ha dara site na mma agha.
2SA 1:13 Mgbe ahụ, Devid jụrụ nwokorobịa ahụ wetara ozi ahụ ajụjụ sị, “Olee ebe i si bịa?” Ọ zara sị ya, “Abụ m onye ọbịa, onye Amalek.”
2SA 1:14 Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji setịpụ aka gị, na-atụghị ụjọ, tigbuo onye Onyenwe anyị tere mmanụ?”
2SA 1:15 Devid kpọrọ otu nʼime ndị ikom ya sị ya, “Gbuo ya!” Nwoke ahụ weere mma agha gbuo ya.
2SA 1:16 Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’ ”
2SA 1:17 Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan.
2SA 1:18 O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha.
2SA 1:19 “Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu. Lee ka ndị bụ dike si daa!
2SA 1:20 “Ekwutela ya na Gat. Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn. Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ. Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ.
2SA 1:21 “Unu ugwu Gilboa, ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu. Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu. Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta ndị dị ike. E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ.
2SA 1:22 “Site nʼọbara ndị e gburu egbu, site nʼanụ ahụ ndị dị ike. Ụta Jonatan alọghachighị azụ. Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi.
2SA 1:23 Sọl na Jonatan, na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara. Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha. Ha dị gara gara karịa ugo. Ha dị ike karịa ọdụm.
2SA 1:24 “Ụmụada Izrel, kwaaranụ Sọl akwa. Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma. Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma.
2SA 1:25 “Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha. E gbuola Jonatan nʼelu ugwu;
2SA 1:26 ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m nʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m. Ịhụnanya i nwere nʼebe m nọ dị omimi karịa ịhụnanya ndị nwanyị.
2SA 1:27 “Lee ka ndị dị ike si daa! Ngwa agha niile abụrụla ihe lara nʼiyi!”
2SA 2:1 Dịka oge na-aga, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “M ga-ebili gbagoo nʼotu obodo dị na Juda?” Onyenwe anyị sịrị, “Gbagoo.” Devid jụkwara, “Olee ebe m ga-agbago?” Onyenwe anyị zara, “Hebrọn.”
2SA 2:2 Devid na nwunye ya abụọ, Ahinoam onye Jezril, na Abigel nwunye ochie Nebal onye Kamel gara nʼebe ahụ.
2SA 2:3 Devid kpọkwaara ndị ikom ahụ ya na ha so, onye ọbụla nʼime ha durukwaara ezinaụlọ ya, ga biri na Hebrọn na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu.
2SA 2:4 Ndị ikom Juda bịakwutere Devid na Hebrọn. Tee ya mmanụ ịbụ eze ebo Juda niile. Mgbe Devid nụrụ na ọ bụ ndị ikom Jebesh Gilead liri Sọl,
2SA 2:5 o zigaara ha ndị ozi ka ha sị ha, “Ka Onyenwe anyị gọzie unu nʼihi obiọma unu gosiri site nʼili Sọl, nna unu ukwu, nʼụzọ kwesiri ekwesi.
2SA 2:6 Ka Onyenwe anyị gosikwa unu obiọma na ikwesi ntụkwasị obi. Mụ onwe m ga-egosikwa unu otu ụdị amara a, nʼihi ihe a unu mere.
2SA 2:7 Ma ugbu a, bụrụnụ dike na dimkpa, nʼihi na Sọl nna unu ukwu anwụọla. Ọzọkwa, ndị Juda niile eteela m mmanụ ịbụ eze ha.”
2SA 2:8 Ma Abna nwa Nea, ọchịagha ndị agha Sọl edurularịị Ishboshet, nwa Sọl, dubata ya nʼobodo Mahanaim.
2SA 2:9 Ọ nọrọ nʼebe ahụ mee ya eze ndị Gilead, ndị Ashuri na ndị Jezril; na ndị Ifrem, ndị Benjamin na Izrel niile.
2SA 2:10 Ishboshet nwa Sọl gbara iri afọ anọ mgbe ọ ghọrọ eze ndị Izrel. Ọ chịkwara afọ abụọ. Ma otu ọ dị, ndị Juda niile nọgidere nʼokpuru Devid.
2SA 2:11 Ogologo oge niile Devid chịrị dịka eze ndị Juda na Hebrọn bụ afọ asaa na ọnwa isii.
2SA 2:12 Otu ụbọchị, Abna nwa Nea, duuru ndị agha Ishboshet nwa Sọl site na Mahanaim jee Gibiọn.
2SA 2:13 Ma Joab, nwa Zeruaya dukwaara ndị agha Devid pụọ izute ha nʼọdọ mmiri Gibiọn. Otu ndị nọdụrụ ala nʼotu akụkụ ọdọ mmiri, ndị nke ọzọ nʼakụkụ ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. Ha cherịtara onwe ha ihu.
2SA 2:14 Abna gwara Joab sị, “Ka ụfọdụ ụmụ okorobịa pụta nʼihu anyị maa aka mgba.” Joab sịrị, “Ka ha pụta.”
2SA 2:15 Ha pụtara ka a gụpụtachara ha. Ha dị mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Benjamin na Ishboshet nwa Sọl, mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Devid.
2SA 2:16 Nwoke ọbụla jidere ibe ya nʼisi were mma agha ya manye ya nʼakụkụ, si otu a wetara onwe ha ọnwụ. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ dị na Gibiọn, Helkat Hazurim, nke pụtara Ala mma agha.
2SA 2:17 Agha siri ike dara nʼụbọchị ahụ. Ma ndị agha Devid lụgburu Abna na ndị agha Izrel.
2SA 2:18 Ụmụ Zeruaya atọ nọ nʼebe ahụ, ya bụ, Joab, na Abishai na Asahel. Asahel bụ nwoke na-agba ọsọ dịka mgbada.
2SA 2:19 Ọ chụwara Abna ọsọ, ọ dịghị mgbe ọ tụgharịrị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe mgbe ọ nọ na-achụ ya ọsọ.
2SA 2:20 Mgbe Abna lere anya nʼazụ hụ ya ka ọ na-abịa, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Ọ bụ gị Asahel?” Asahel zara sị, “Ọ bụ m.”
2SA 2:21 Abna gwara ya okwu sị ya, “Tụgharịa nʼakụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, jide otu nʼime ụmụ okorobịa ndị a. Napụ ya ngwa agha ya niile.” Ma Asahel akwụsịghị ịchụ ya ọsọ.
2SA 2:22 Abna gwara Asahel ọzọ sị, “Laghachi azụ. Kwụsị ịchụ m ọsọ! Gịnị mere m ga-eji tigbuo gị? Olee otu m ga-esi lekwasị nwanne gị Joab anya nʼihu ma m gbuo gị?”
2SA 2:23 Ma Asahel jụrụ ịlaghachi azụ. Nʼihi ya, Abna weere isi ùbe ya mapuo ya afọ. Ùbe ahụ sikwa ya nʼazụ pụta. Ọ dara nʼala, nwụọ otu mgbe ahụ. Ndị niile bịaruru ebe ahụ ọ dara nwụọ kwụsịrị. Ha agakwaghị nʼihu ịchụ ndị ọzọ.
2SA 2:24 Ma Joab na Abishai chụgidere Abna ọsọ. Anwụ adaala mgbe ha bịarutere nʼugwu nta Ama, nke dị Gịa nso, nʼụzọ e si aga nʼọzara Gibiọn.
2SA 2:25 Ndị ikom Benjamin chịkọtara onwe ha ọnụ dịnyere Abna. Ha niile guzooro nʼelu otu ugwu dịka otu usuu ndị agha.
2SA 2:26 Mgbe ahụ, Abna kpọrọ Joab oku sị ya, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka anyị ga na-eji mma agha na-egburita onwe anyị? Olee mgbe ị ga-akpọghachi ndị gị ka ha hapụ ịchụ na igbu ụmụnne ha? Ị maghị na ihe dị otu a ga-eweta obi ilu?”
2SA 2:27 Joab zara sị, “Eji m aha Chineke ṅụọ iyi na-asị na ọ bụrụ na i gbara nkịtị, ndị a gaara achụso ụmụnna ha ọsọ na-akwụsịghị ruo nʼụtụtụ echi.”
2SA 2:28 Mgbe ahụ, Joab fụrụ opi ike ya. Nke a mere ka ndị ya kwụsị ịchụ ndị Izrel. Ha kwụsịkwara ibu agha.
2SA 2:29 Nʼabalị ahụ, Abna na ndị ikom ya jere ije gafee ndagwurugwu Jọdan, gabigakwa osimiri Jọdan, jee ije nʼụtụtụ echi ya tutu ha eruo Mahanaim.
2SA 2:30 Joab kwụsịrị ịchụ Abna ọsọ, ọ chịkọtara ndị agha niile. Mgbe ọ gụrụ ha ọnụ, ọ chọpụtara na mmadụ iri na itoolu nʼime ndị ikom Devid, tinyere Asahel nwanne ya, bụ ndị na-alọtaghị agha.
2SA 2:31 Ma ndị ikom Devid gburu narị ndị agha Benjamin atọ na iri isii, bụ ndị so Abna.
2SA 2:32 Emesịa, Joab na ndị agha ya buuru ozu Asahel gaa lie ya na Betlehem, nʼili nna ya. Ha jere ije abalị ahụ niile tutu ha erute Hebrọn mgbe chi bidoro ịbọ.
2SA 3:1 Agha dị nʼetiti ndị ụlọ Sọl na ụlọ Devid dịịrị ruo oge toro ogologo. Ma ka Devid na-aga nʼihu na-esiwanye ike, ụlọ Sọl na-aga azụ na-ada ada.
2SA 3:2 A mụtaara ọtụtụ ụmụ ndị ikom nye Devid mgbe ọ nọ na Hebrọn. Ọkpara ya bụ Amnọn nke, Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ.
2SA 3:3 Nke abụọ bụ Kiliab, nke Abigel, nwunye ochie Nebal, onye Kamel mụrụ. Nke atọ bụ Absalọm, nke Maaka nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua mụrụ.
2SA 3:4 Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit. Nke ise bụ Shefataya nwa Abital;
2SA 3:5 nke isii bụ Itream, nwa nwoke Egla nwunye Devid. Ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn.
2SA 3:6 O ruo, mgbe agha na-aga nʼihu nʼetiti ụlọ Sọl na ụlọ Devid, na Abna nọ na-eme ka ọnọdụ ya sie ike nʼụlọ Sọl.
2SA 3:7 Ma Sọl nwererịị otu iko nwanyị aha ya bụ Rizpa, nwa Aịa. Ishboshet jụrụ Abna ajụjụ sị, “Gịnị mere gị na iko nwanyị nna m ji dinaa?”
2SA 3:8 Iwe were Abna nke ukwuu nʼihi ihe Ishboshet kwuru. Ya mere, ọ zara, “Ọ bụ isi nkịta nke ụlọ Juda ka m bụ? Taa ka m ji obi m niile na-ejere ụlọ nna gị, bụ Sọl, na ezinaụlọ ya, na ndị enyi ya ozi. Ewerebeghị m gị nyefee nʼaka Devid. Ma lee, ugbu a i na-ebo m ebubo ajọ omume nʼihe metụtara nwanyị a.
2SA 3:9 Ka Chineke mesoo Abna mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m emereghị Devid ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye ya.
2SA 3:10 Ịnapụ ụlọ Sọl alaeze ahụ, na ime ka ocheeze Devid guzosie ike nʼebe Izrel niile na Juda niile nọ, site na Dan ruo Bịasheba.”
2SA 3:11 Ishboshet ekwughị ihe ọbụla nʼihi na ọ na-atụ Abna egwu.
2SA 3:12 Ngwangwa, Abna zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Devid sị ya, “Onye nwee ala a? Ka mụ na gị gbaa ndụ. Aga m enyere gị aka kpọghachite ndị Izrel ka ha dịnyeere gị.”
2SA 3:13 Devid sịrị, “Ọ dị mma. Mụ na unu ga-agba ndụ. Ma ọ dị otu ihe m chọrọ nʼaka unu. Unu agaghị ahụ ihu m anya ma ọ bụrụ na unu eduteghị Mikal, nwa Sọl, mgbe unu ga-abịa ịhụ m.”
2SA 3:14 Devid ziri Ishboshet nwa Sọl ozi sị ya, “Dulatara m nwunye m Mikal, nʼihi na ọ bụ narị apị ndị Filistia ka m ji lụtara ya onwe m.”
2SA 3:15 Na-atụfughị oge, Ishboshet nyere iwu ka e site nʼaka di ya bụ Paltiel, nwa Laish, kpọpụta ya.
2SA 3:16 Mgbe ha du ya na-aga, Paltiel sogidere ya nʼazụ na-akwa akwa tutu ha eruo Bahurim. Nʼebe ahụ ka Abna nọ sị ya, “Laghachi ugbu a.” Ọ tụgharịrị laa.
2SA 3:17 Abna na ndị okenye Izrel kparịtara ụka. Ọ chetaara ha sị ha, “Ọ dịla anya kemgbe unu na-achọ ka Devid bụrụ eze unu.
2SA 3:18 Ugbu a meenụ ya, nʼihi na Onyenwe anyị kweere Devid nkwa, ‘Site nʼaka ohu m bụ Devid ka m ga-esi zọpụta ndị m bụ Izrel site nʼaka ndị Filistia, nakwa site nʼaka ndị iro ha niile.’ ”
2SA 3:19 Abna gwakwara ndị Benjamin okwu. Emesịa, o jere Hebrọn ịgwa Devid ihe niile ndị Izrel na ndị Benjamin zubere ime.
2SA 3:20 Abna, ya na iri ndị ikom abụọ so gakwuru Devid na Hebrọn. Mgbe ha ruru, Devid meere ha oke oriri.
2SA 3:21 Mgbe ahụ, Abna sịrị Devid, “Ka m gaa ngwangwa ga kpọkọtaa ndị Izrel niile, nye onyenwe m bụ eze, ka gị na ha gbaa ndụ, ka ị bụrụ eze ndị niile mkpụrụobi gị na-achọsi ike.” Ya mere Devid zilara Abna. Ọ laa nʼudo.
2SA 3:22 Nʼotu mgbe ahụ, ndị ikom Devid na Joab si nʼebe ha gara ịpụnara ndị mmadụ ihe lọta, bukọrọ ọtụtụ ihe nkwata. Ma Abna anọghịkwa na Hebrọn ya na Devid, nʼihi na Devid ezipụla ya, ọ pụọla nʼudo.
2SA 3:23 Mgbe Joab na ndị agha ya lọtara, a kọọrọ ya na Abna, nwa Nea, bịara hụ eze, na ọ laakwala nʼudo.
2SA 3:24 Ya mere Joab jekwuuru eze sị ya, “Gịnị ka i mere? Lee, Abna bịakwutere gị. Gịnị mere i ji hapụ ya ka ọ laa? Lee ya ugbu a, ọ laala!
2SA 3:25 Ị maara onye Abna nwa Nea bụ? Ọ bịara ịghọ gị aghụghọ, na inyocha njegharị gị, ịchọpụta ihe niile ị na-eme.”
2SA 3:26 Mgbe Joab si nʼihu Devid pụta, o zipụrụ ndị ozi ka ha sochie Abna azụ, gwa ya ka ọ laghachi. Ha hụrụ ya nʼolulu mmiri Sira. O sokwara ha laghachi, ma Devid amaghị ihe banyere nke a.
2SA 3:27 Mgbe Abna lọghachiri na Hebrọn, Joab duuru ya gaa nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dịka ọ chọrọ ka ha kparịtaa ụka. Ngwangwa, ọ mịpụtara nwa mma ya, jiri ya magbuo Abna, nʼihi ịbọ ọbọ ọbara nwanne ya, bụ Asahel.
2SA 3:28 Mgbe emesịrị, Devid nụrụ banyere ya, ọ sịrị, “Aka m dị ọcha, ya na nke alaeze m nʼihu Onyenwe anyị banyere ọbara Abna, nwa Nea.
2SA 3:29 Ka ikpe ọmụma a dakwasị Joab nʼisi, nakwa ezinaụlọ nna ya niile, ka a gharakwa ịhụ nʼụlọ Joab onye na-adịghị arịa ọrịa ahụ ihe ntokasị, maọbụ ọrịa ekpenta, maọbụ onye ji mkpara eji akpa akwa, maọbụ onye ga-anwụ site na mma agha, maọbụ onye ụkọ nri adịghị akọ.”
2SA 3:30 Ya mere, Joab na Abishai nwanne ya gburu Abna, nʼihi na Abna gburu nwanne ha Asahel nʼagha Gibiọn.
2SA 3:31 Emesịa, Devid kpọrọ Joab na ndị niile so ya sị ha, “Dọwaanụ uwe unu, yikwasị onwe unu akwa mkpe, jegharịakwanụ nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi Abna.” Eze, bụ Devid nʼonwe ya so ndị bu ozu Abna nʼazụ.
2SA 3:32 Ha liri Abna na Hebrọn. Eze na ndị Izrel niile kwara akwa nʼakụkụ ili ahụ nʼihi Abna.
2SA 3:33 Eze bụrụ abụ akwa nʼihi Abna, sị, “O kwesiri ka Abna nwụọ dịka onye nzuzu?
2SA 3:34 E kekwaghị aka gị abụọ ihe. E kekwaghị ụkwụ gị abụọ agbụ. Ị nwụrụ dịka onye ndị ajọ omume gburu.” Mmadụ niile bekwara akwa ọzọ nʼihi ya.
2SA 3:35 Mgbe ahụ, ndị mmadụ bịakwutere Devid rịọọ ka o ritụ ihe, mgbe ìhè ụbọchị ka dị, ma Devid ṅụrụ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m edetụ achịcha maọbụ ihe ọbụla ọzọ ọnụ tutu ruo mgbe anyanwụ dara.”
2SA 3:36 Ndị mmadụ nụrụ ihe o kwuru, okwu ahụ tọkwara ha ụtọ. Nʼezie, ihe niile eze mere tọrọ ha ụtọ.
2SA 3:37 Nʼụbọchị ndị mmadụ niile nọ ebe ahụ ka Izrel niile matara na eze amaghị ihe banyere ọnwụ Abna, nwa Nea.
2SA 3:38 Devid jụrụ ndị ikom ya ajụjụ sị, “Unu ghọtakwara na onye a dara nʼIzrel taa bụ nwa eze na onye dị mkpa?
2SA 3:39 Ọ bụ ezie na m bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ ịbụ eze, ma o nweghị ihe m pụrụ ime ụmụ ndị ikom Zeruaya ndị a, nʼihi na ha dị ike karịa m. Ka Onyenwe anyị kwụghachi onye ọjọọ ihe ọjọọ ọ mere.”
2SA 4:1 Mgbe Ishboshet nwa Sọl nụrụ na Abna anwụọla na Hebrọn. Ọ tụrụ egwu. Ndị Izrel tụkwara egwu hie nne.
2SA 4:2 Nʼoge a, nwa Sọl nwere mmadụ abụọ ndị bụ ndịisi ndị na-aga apụnara ndị mmadụ ihe. Aha otu onye bụ Baana, aha onye nke ọzọ bụ Rekab. Ha abụọ bụ ụmụ Rimọn onye Beerọt, nke dị nʼebo Benjamin. A na-agụ ndị Beerọt dịka ndị Benjamin,
2SA 4:3 nʼihi na ndị Beerọt gbara ọsọ agha gbalaa Gitaim, obodo ndị Benjamin. Ha bikwa nʼebe ahụ ruo taa dịka ndị ọbịa.
2SA 4:4 (Jonatan nwa Sọl nwere otu nwa nwoke dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ. Ọ gbara afọ ise mgbe akụkọ banyere Sọl na Jonatan si Jezril bịarute ha. Nwanyị na-eku ya kuuru ya bido ịgbapụ ọsọ, ma dịka ọ na-agba ọsọ, nwantakịrị nwoke ahụ dara nʼala ghọọ onye ngwụrọ. Aha ya bụ Mefiboshet.)
2SA 4:5 Nʼoge a, Rekab na Baana ụmụ Rimọn, onye Beerọt bịaruru nʼụlọ Ishboshet nʼoge ehihie, mgbe ọ nọ na-ezu ike.
2SA 4:6 Ha banyere nʼime ime ụlọ, dịka a ga-asị na ha na-aga iburu ọka wiiti. Mgbe ha banyere nʼebe ahụ, ha mara Ishboshet mma nʼafọ. Emesịa, Rekab na nwanne ya Baana si nʼụlọ ahụ zopu onwe ha.
2SA 4:7 Ha abatala nʼụlọ mgbe Ishboshet dinara nʼelu ihe ndina ya, nʼime ụlọ ndina ya. Mgbe ha machara ya mma, gbuo ya, ha bipụrụ ya isi. Buru isi ya gbalaga. Jee ije abalị ahụ niile gafee ọzara.
2SA 4:8 Ha buuru isi Ishboshet butere Devid na Hebrọn, sị eze, “Taa ka Onyenwe anyị bọọrọ onyenwe m eze ọbọ megide Sọl na mkpụrụ ya. Nke a bụ isi Ishboshet, nwa onye iro gị Sọl, onye chọsịrị ike iwepụ ndụ gị.”
2SA 4:9 Ma Devid zara Rekab na Baana ụmụ Rimọn onye Beerọt okwu sị ha, “Dịka Onyenwe anyị si adị ndụ, onye napụtara m site na nsogbu m niile,
2SA 4:10 mgbe otu onye bịakwutere m gwa m na Sọl anwụọla, na-eche nʼobi ya na o wetaara m oziọma. Egburu m ya na Ziklag, si otu ahụ kwụọ ya ụgwọ oziọma ahụ o chere na ọ wetaara m.
2SA 4:11 Ọ bụladị karịa nke a, mgbe ndị ikom ajọ omume gburu nwoke onye aka ya dị ọcha nʼụlọ ya, nʼelu ihe ndina ya? M ga-ahapụ ịbọtara onye e gburu egbu ọbọ, si otu a kpochapụ unu nʼụwa!”
2SA 4:12 Devid nyere ụmụ okorobịa ya iwu ka ha gbuo mmadụ abụọ ahụ. Ha gbukwara ha. Emesịa, ha bipụrụ aka ha na ụkwụ ha. Were ozu ha kwụba ya nʼakụkụ ọdọ mmiri Hebrọn. Ha wekwaara isi Ishboshet, lie ya nʼili Abna na Hebrọn.
2SA 5:1 Mgbe ahụ, ndị ebo Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ.
2SA 5:2 Nʼoge gara aga, mgbe Sọl bụ eze na-achị anyị, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’ ”
2SA 5:3 Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, ha na eze Devid gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere Devid mmanụ ịbụ eze Izrel.
2SA 5:4 Devid gbara iri afọ atọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara iri afọ anọ.
2SA 5:5 Ọ chịrị ndị Juda niile na Hebrọn afọ asaa na ọnwa isii. Chịakwa ndị Izrel na Juda niile mgbe ọ nọ na Hebrọn na mgbe ọ nọ na Jerusalem iri afọ atọ na atọ,
2SA 5:6 Eze na ndị ikom ya zọọrọ ije garuo Jerusalem ibuso ndị Jebus bi nʼebe ahụ agha. Ndị Jebus gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a, ọ bụladị ndị ìsì na ndị ngwụrọ nwere ike ịchụghachi gị azụ.” Ha na-eche sị, “Devid agaghị abata nʼebe a,”
2SA 5:7 nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid.
2SA 5:8 Nʼụbọchị ahụ, Devid kwuru sị, “Onye ọbụla ga-emeri ndị Jebus ga-esite nʼọnụ warawara ebe mmiri si abanye nʼobodo a banyekwuru ndị ngwụrọ na ndị ìsì a bụ ndị iro Devid.” Ọ bụ nke a mere ha ji ekwu okwu sị, “Ndị ìsì na ndị ngwụrọ agaghị abata nʼụlọeze ahụ.”
2SA 5:9 Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike, kpọọ ya obodo Devid. O wuru akụkụ ebe dị gburugburu ya, site na Milo baa ruo nʼime ya.
2SA 5:10 Ma ọ gara nʼihu na-adị ukwuu karịa, nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere ya.
2SA 5:11 Hiram bụ Eze Taịa, zitere Devid osisi sida e ji ewu ụlọ, na ndị ǹka osisi, ndị na-ewu ụlọ. Ha wuuru Devid ụlọeze.
2SA 5:12 Mgbe ahụ, Devid ghọtara na Onyenwe anyị emeela ka o guzosie ike dịka eze ndị Izrel. Bulikwa alaeze ya elu nʼihi ndị ya Izrel.
2SA 5:13 Mgbe Devid sitere na Hebrọn kwabata na Jerusalem; ọ lụrụ ndị inyom ọzọ, nwetakwara onwe ya ọtụtụ ndị iko nwanyị. Ọ mụtakwara ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị.
2SA 5:14 Ndị a bụ aha ụmụ a mụụrụ ya na Jerusalem: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn,
2SA 5:15 Ibha, Elishua, Nefeg, Jafia,
2SA 5:16 Elishama, Eliada na Elifelet.
2SA 5:17 Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel, ha pụrụ ka igwe ha niile ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, gbadaa nʼime ebe ahụ e wusiri ike.
2SA 5:18 Ma ndị Filistia bịara, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim niile.
2SA 5:19 Mgbe ahụ, Devid jụrụOnyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, nʼihi na aghaghị m inyefe ndị Filistia nʼaka gị.”
2SA 5:20 Ya mere, Devid gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Onyenwe anyị enupula megide ndị iro m nʼihu m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal-Perazim.
2SA 5:21 Ndị Filistia hapụrụ arụsị niile ha nʼebe ahụ. Devid na ndị ikom ya chịkọtara ha chịpụ.
2SA 5:22 Ma ndị Filistia lọghachiri ọzọ, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim.
2SA 5:23 Nʼihi nke a, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase, ọ zara sị, “Esitekwala nʼihu ha gaa, kama gaa gburugburu ruo nʼazụ ha, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ.
2SA 5:24 Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mee ngwa malite ọgụ, nʼihi na nke a pụtara na Onyenwe anyị eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.”
2SA 5:25 Devid mere dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. O tigburu ndị Filistia, site na Geba ruo Gaza.
2SA 6:1 Emesịa, Devid chịkọtara iri puku ndị agha Izrel atọ a zụziri azụzi,
2SA 6:2 Ya na ndị ikom ya niile gara Baala nʼime Juda, isi nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nke akpọkwasịrị Aha ya, bụ aha Onyenwe anyị. Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim.
2SA 6:3 Ha dọkwasịrị igbe Chineke ahụ nʼelu ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ, buputa ya site nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu nta. Ọ bụ Ụza na Ahio, ụmụ Abinadab, na-edu ụgbọala ọhụrụ ahụ,
2SA 6:4 nke igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼelu ya, Ahio butere ụzọ na-aga nʼihu igbe ahụ.
2SA 6:5 Devid na ndị Izrel weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ji abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na ihe egwu dị iche iche, dịka ịgba na ekwe na-eti egwu.
2SA 6:6 Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Nakọn, Ụza setịpụrụ aka ya, jide igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ.
2SA 6:7 Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, nʼihi omume enweghị nsọpụrụ o mere. Ya mere, Chineke tigburu ya. Ọ nwụọ nʼebe ahụ nʼakụkụ igbe Chineke.
2SA 6:8 Mgbe ahụ, iwe were Devid, nʼihi ọnụma Onyenwe anyị dakwasịrị Ụza. Ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza.
2SA 6:9 Devid tụrụ egwu Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. O kwuru sị, “Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa bịakwute m?”
2SA 6:10 O kweghị ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git.
2SA 6:11 Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nọrọ nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ya na ezinaụlọ ya niile.
2SA 6:12 Mgbe a gwara eze bụ Devid si, “Onyenwe anyị agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid.
2SA 6:13 Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; ọ na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja.
2SA 6:14 Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu Onyenwe anyị. Ọ yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ,
2SA 6:15 mgbe ya na ndị Izrel niile ji iti mkpu na ụda ịfụ opi ike na-ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
2SA 6:16 Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal, nwa Sọl lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-awụli elu na-etekwa egwu nʼihu Onyenwe anyị, o ledara ya anya nʼime obi ya.
2SA 6:17 Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, guzobe ya nʼọnọdụ ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Devid chụrụ aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu Onyenwe anyị.
2SA 6:18 Mgbe ọ chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
2SA 6:19 O nyekwara onye ọbụla nʼetiti igwe ndị Izrel niile ahụ, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ. Ndị a niile lara, onye ọbụla nʼụlọ nke ya.
2SA 6:20 Mgbe Devid lọtara ka ọ gọzie ndị ụlọ ya, Mikal, ada Sọl pụtara izute ya, sị, “Lee ka eze Izrel si mee onwe ya onye dị ukwuu taa! Ọ gbara onwe ya ọtọ na mbara, nʼihu ndị ohu nwanyị nke ndị odibo ya dịka mmadụ efu.”
2SA 6:21 Ma Devid zara Mikal sị ya, “Ọ bụ nʼihu Onyenwe anyị onye họpụtara m karịa nna gị maọbụ onye ọbụla ọzọ sitere nʼụlọ ya ka m tere egwu. E, Onyenwe anyị ahụ họpụtara m ịbụ onyendu Izrel, ndị nke ya. Nʼezie, aga m aga nʼihu ịkpa agwa dịka onye nzuzu nʼihi ịsọpụrụ Onyenwe anyị.
2SA 6:22 E, aga m aga nʼihu ịghọ onye na-enweghị uche, na onye e weturu ala nʼanya onwe m. Ma ụmụ agbọghọ ndị ahụ i kwuru okwu ha, ha ga-asọpụrụ m!”
2SA 6:23 Mikal, ada Sọl amụtaghị nwa ọbụla ruo nʼoge ọnwụ ya.
2SA 7:1 O ruo mgbe eze nọsara ahụ nʼụlọeze ya, mgbe Onyenwe anyị mekwara ka o site nʼaka ndị iro ya nọ gburugburu zuru ike,
2SA 7:2 ọ sịrị Netan, bụ onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼime ụlọ ikwu.”
2SA 7:3 Netan zaghachiri eze sị, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi gaa nʼihu mee ya, nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere gị.”
2SA 7:4 Ma nʼabalị ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Netan ntị, na-asị,
2SA 7:5 “Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ gị ga-ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi?
2SA 7:6 Nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta ndị Izrel ruo taa. Kama ana m ejegharị site otu ebe gaa ebe ọzọ, were ụlọ ikwu mere ebe obibi m.
2SA 7:7 Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m Izrel, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?” ’
2SA 7:8 “Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị. Mee gị onye na-achị ndị m Izrel.
2SA 7:9 Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa.
2SA 7:10 Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha; ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ,
2SA 7:11 dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m enyekwa gị ezumike site nʼebe ndị iro gị niile nọ. “ ‘Onyenwe anyị na-ekwupụtara gị, na Onyenwe anyị ya onwe ya, ga-eguzobere gị ụlọ.
2SA 7:12 Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe i ga-esoro nna nna gị ha dinaa nʼọnwụ, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, onye bụ anụ ahụ na ọbara gị, aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike.
2SA 7:13 Ọ bụ ya ga-ewuru m ụlọ. Aga m eme ka ocheeze nke alaeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
2SA 7:14 Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna. Ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Ọ bụrụ na o jehie, aga m eji mkpanaka mmadụ taa ya ahụhụ. Werekwa ihe otiti si nʼaka ndị mmadụ dụọ ya ọdụ.
2SA 7:15 Ma agaghị ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m si wezuga ya site nʼebe Sọl nọ, bụ onye m wezugara site nʼihu gị.
2SA 7:16 Ụlọ gị na alaeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nʼihu m. A ga-eme ka ocheeze gị bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ”
2SA 7:17 Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị.
2SA 7:18 Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị: “Onye ka m bụ, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a?
2SA 7:19 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị. Ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, nke a bụkwa ụkpụrụ metụtara mmadụ efu.
2SA 7:20 “Ma gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị? O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma.
2SA 7:21 Nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ohu gị mata ha.
2SA 7:22 “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, lee ka i si dị ukwuu! Ọ dịghị onye dịka gị. Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị.
2SA 7:23 Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa nke Chineke gara ịgbapụta dịka otu ndị nye onwe ya, na iji mere onwe ya aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt?
2SA 7:24 I meela ka ndị gị Izrel guzosie ike, dịka ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Ma gị onwe gị kwa, Onyenwe anyị, abụrụla Chineke ha.
2SA 7:25 “Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke, debe nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya ka ọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị
2SA 7:26 Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-asị, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke na-achị Izrel’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị bụ Devid guzosie ike nʼanya gị.
2SA 7:27 “O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel, nʼihi na ị kpugheerela ohu gị ihe a, na-asị, ‘Aga m ewuru gị ụlọ.’ Ya mere, ohu gị ji nwee obi ike ikpere gị ekpere a.
2SA 7:28 O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, ị bụ Chineke nʼezie. Okwu gị kwesiri ntụkwasị obi. I kweekwala ohu gị nkwa ihe ọma ndị a.
2SA 7:29 Ugbu a biko, ka ọ masị gị ịgọzi ụlọ ohu gị, ka ọ dịgide nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na gị, o Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola ya, sitekwa na ngọzị gị, ụlọ ohu gị ga-abụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.”
2SA 8:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia. Mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Meteg-Amaa site nʼọchịchị ndị Filistia.
2SA 8:2 Devid merikwara ndị Moab. O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.
2SA 8:3 Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis.
2SA 8:4 Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.
2SA 8:5 Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha.
2SA 8:6 O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs. Ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwa ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
2SA 8:7 Devid chịkọtara ọta ọlaedo ndịisi agha Hadadeza ji lụọ agha webata ha na Jerusalem.
2SA 8:8 Site na Teba nakwa Beirotai, bụ obodo Hadadeza na-achị. Eze Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu.
2SA 8:9 Mgbe Tou, eze Hamat, nụrụ na Devid emeriela ndị agha Hadadeza niile,
2SA 8:10 o zipụrụ Joram, nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee Devid, nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Joram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaọcha, nke ọlaedo na nke bronz bịa.
2SA 8:11 Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o si mee ọlaọcha na ọlaedo si na mba niile ndị ọ lụgburu.
2SA 8:12 Mba ndị a bụ: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. O dokwara nsọ nye Onyenwe anyị ihe ọ kwatara nʼagha site nʼaka Hadadeza nwa Rehob, bụ eze Zoba.
2SA 8:13 Devid meere onwe ya aha, mgbe o si nʼitigbu puku ndị ikom Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu lọghachite.
2SA 8:14 O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
2SA 8:15 Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ.
2SA 8:16 Onyeisi ndị agha ya bụ Joab nwa Zeruaya; ode akwụkwọ obodo bụ Jehoshafat, nwa Ahilud.
2SA 8:17 Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja; Seraya bụ ode akwụkwọ eze.
2SA 8:18 Benaya, nwa Jehoiada, bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndị nchụaja.
2SA 9:1 Otu ụbọchị, Devid jụrụ ajụjụ sị, “O nwere onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Achọrọ m igosi onye ahụ obi ebere nʼihi Jonatan.”
2SA 9:2 Ọ nụrụ ihe banyere otu nwoke aha ya bụ Ziba, onye bụ otu nʼime ndị ohu Sọl. O ziri ozi ka a kpọọ ya. Mgbe ọ bịara nʼihu Devid, eze jụrụ ya sị, “Ọ bụ gị bụ Ziba?” Ọ zara sị, “E, onyenwe m, ọ bụ m ohu gị.”
2SA 9:3 Eze jụrụ ya sị, “Ọ dị onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Ọ bụrụ na ọ dị onye fọdụrụ, achọrọ m igosi ya ụdị obiọma Chineke na-egosi.” Ziba zara ya sị, “Otu nwa nwoke Jonatan, nke dara ngwụrọ nọ ndụ.”
2SA 9:4 Eze jụrụ, “Ebee ka ọ nọ?” Ziba zaghachiri, “Ọ nọ na Lo Deba, nʼụlọ Makia, nwa Amiel.”
2SA 9:5 Ya mere eze Devid ziri ka e site nʼobodo Lo Deba, nʼụlọ Makia nwa Amiel kpọta ya.
2SA 9:6 Mgbe Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, bịara nʼebe Devid nọ, o hulatara isi, kpọọrọ ya isiala, nʼọnọdụ nsọpụrụ. Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ya aha sị, “Mefiboshet,” Mefiboshet zara sị ya, “A bụ m ohu gị.”
2SA 9:7 Ma Devid sịrị ya, “Atụla egwu, nʼezie, aga m egosi gị obiọma nʼihi nna gị Jonatan. Aga m enyeghachi gị ala niile nna nna gị Sọl nwere. Ma ị ga-eso soro m na-eri nri na tebul m oge niile.”
2SA 9:8 Mefiboshet dara nʼala nʼihu eze sị, “Eze, onye ka m bụ i ji egosi nkịta nwụrụ anwụ dịka m obi ebere?”
2SA 9:9 Eze kpọrọ Ziba ohu Sọl ahụ sị ya, “Enyeghachila m nwa nwa nna gị ukwu ihe niile Sọl na ụlọ ya nwere.
2SA 9:10 Gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị ozi gị ga-arụ ọrụ nʼubi ya ịrụpụta nri. Ma Mefiboshet, nwa nwa nna gị ukwu ga na-eri ihe na tebul m.” Ziba, nwere ụmụ ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ.
2SA 9:11 Ọ sịrị eze, “Onyenwe m, ohu gị ga-eme ihe niile eze nyere m nʼiwu.” Site nʼoge ahụ, Mefiboshet riri nri na tebul Devid dịka ọ bụ otu nʼime ụmụ ndị ikom eze.
2SA 9:12 Mefiboshet nwekwara otu nwa nwoke aha ya bụ Mika. Ziba na ndị niile bi nʼụlọ ya niile ghọrọ ndị ohu Mefiboshet.
2SA 9:13 Ma Mefiboshet biri na Jerusalem nʼihi na ọ bụ na tebul eze ka ọ na-eri nri mgbe niile. Ọ bụ onye dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ.
2SA 10:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze ndị Amọn nwụrụ. Hanọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2SA 10:2 Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere dịka nna ya si gosi m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya. Mgbe ndị ikom Devid rutere nʼala ndị Amọn,
2SA 10:3 ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na Devid eziteghị ha ịbịakwute gị, naanị ka ha bịa mee nledo nʼobodo a, nyochapụta ya ma kwatuo ya?”
2SA 10:4 Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ otu mpaghara afụọnụ nwoke ọbụla, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha.
2SA 10:5 Mgbe a gwara Devid ihe mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha gaa zute ndị ikom ahụ, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.”
2SA 10:6 Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, ha gara goo iri puku ndị agha abụọ ji ụkwụ eje site nʼAram, Bet-Rehob nakwa Zoba. Ha gokwara eze Maaka ya na puku ndị ikom, tinyekwara iri puku ndị ikom na puku abụọ ọzọ site nʼala Tob.
2SA 10:7 Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha.
2SA 10:8 Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha. Ma ndị Aram, ndị si Zoba na Rehob, na ndị ikom Tob na Maaka, nọpụrụ onwe ha na mbara ala.
2SA 10:9 Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram.
2SA 10:10 O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, zipụkwa ha izute ndị Amọn nʼagha.
2SA 10:11 Joab sịrị, “Ọ bụrụ na ndị agha Aram akarịa m ike, pụta bịa nyere m aka; ma ọ bụrụkwanụ na ndị Amọn akarịa gị ike, aga m apụta bịa napụta gị.
2SA 10:12 Nwee obi ike, ka anyị lụọ ọgụ a dịka ndị dị ike, nʼihi ndị anyị, na obodo niile nke Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị meekwa ihe dị mma nʼanya ya.”
2SA 10:13 Mgbe ahụ, Joab na ndị agha so ya bịara nso ibuso ndị Aram agha, ha sitere nʼihu ha gbapụ ọsọ.
2SA 10:14 Mgbe ndị Amọn hụrụ ka ndị Aram na-agbapụ ọsọ, ha onwe ha gbakwara ọsọ nʼihu Abishai, gbaba nʼime obodo. Ya mere, Joab sitere nʼịlụso ndị Amọn agha lọghachi, bịa na Jerusalem.
2SA 10:15 Mgbe ndị Aram hụrụ na ndị Izrel tigburu ha; ha lara, chịkọtaa onwe ha ọnụ.
2SA 10:16 Hadadeza mere ka a kpọta ndị Aram site nʼofe ọzọ nke Osimiri Yufretis. Ha gara Hilam, ha na ọchịagha ndị agha Hadadeza, a na-akpọ Shobak, onye na-edu ha.
2SA 10:17 Mgbe a gwara Devid banyere nke a, ọ chịkọtara ndị Izrel niile, gafee Jọdan, jeruo Hilam. Ndị Aram doro usoro agha ha izute Devid, lụsokwaa ya agha.
2SA 10:18 Ma ha sitere nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, Devid gburu narị ndị ikom asaa na-anya ụgbọ agha nke ịnyịnya na-adọkpụ. Gbukwaa iri puku ndị agha anọ na-eji ụkwụ eje. O tidara Shobak, bụ ọchịagha ndị agha ha, ọ nwụọ nʼebe ahụ.
2SA 10:19 Mgbe ndị eze niile nọ nʼokpuru ọchịchị Hadadeza hụrụ na Izrel etigbuola ha, ha mere ka ha na ndị Izrel dịrị nʼudo, bụrụkwa ndị nọ nʼokpuru ha. Ya mere, ndị Aram tụrụ egwu inyere ụmụ Amọn aka ọzọ.
2SA 11:1 Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Devid zipụrụ Joab ọchịagha ya, na ndị agha Izrel. Ha bibiri ndị Amọn, nọchibidokwa Raba. Ma Devid nọdụrụ na Jerusalem.
2SA 11:2 Nʼotu uhuruchi, Devid sitere nʼihe ndina ya bilie, gagharịa nʼelu ụlọeze ya. Ọ sitere nʼelu ụlọ ahụ hụ otu nwanyị na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu nʼile anya.
2SA 11:3 Devid ziri ozi ka a jụta onye nwanyị ahụ bụ, ma a gwara ya na ọ bụ Batsheba, nwa Eliam, nwunye Ụraya onye Het.
2SA 11:4 Devid ziri ka a gaa kpọta ya. Mgbe ọ bịara, ya na Devid dinara. (Ka ọ ghụchasịrị onwe ya site nʼadịghị ọcha ya nke ọnwa ahụ.) Ọ laghachiri nʼụlọ ya.
2SA 11:5 Nwanyị a mechara dị ime, bịa ziga ozi ka agwa Devid. Ọ sịrị, “Adị m ime.”
2SA 11:6 Mgbe Devid nụrụ ya, o zigaara Joab ozi sị ya, “Zitere m Ụraya, onye Het.”
2SA 11:7 Mgbe Ụraya bịakwutere ya, Devid jụrụ ya otu Joab mere, na otu ndị agha Izrel dị na otu agha si aga.
2SA 11:8 Devid sịrị Ụraya, “Laa nʼụlọ gị gaa saa ụkwụ gị.” Ụraya si nʼụlọeze pụọ. E zipụkwara onyinye nke ndị na-ejere eze ozi ji sochie ya azụ.
2SA 11:9 Ma Ụraya agaghị nʼụlọ ya. Kama o so ndị na-ejere eze ozi dinaa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze.
2SA 11:10 Mgbe a gwara Devid na Ụraya alaghị nʼụlọ ya, Devid kpọrọ Ụraya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụghị ije dị anya ka i si lọta? Gịnị mere ị larughị nʼụlọ gị?”
2SA 11:11 Ụraya zara Devid, “Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na Izrel na Juda niile nọ nʼụlọ ikwu. Nna m ukwu Joab na ndị agha nna m ukwu nọ nʼọhịa. M ga-esi aṅaa laa nʼụlọ m, iri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ na isoro nwunye m dinaa? Ana m aṅụ iyi na agaghị m eme ihe dị otu a.”
2SA 11:12 Devid gwara ya sị, “Ọ dị mma, nọdụ nʼebe a taa, echi ị ga-alaghachikwa nʼọgbọ agha.” Ụraya kwenyere nọdụ na Jerusalem ụbọchị ahụ, nakwa ụbọchị na-eso ya.
2SA 11:13 Emesịa, Devid kpọrọ ya oriri, meekwa ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, ma nke a emeghị ka ọ laa nʼụlọ ya nʼabalị ahụ, kama ọ bụkwa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze ka o dinara nʼetiti ndị na-ejere eze ozi.
2SA 11:14 Nʼụtụtụ echi ya, Devid degaara Joab akwụkwọ, zighachịkwa ya site nʼaka Ụraya.
2SA 11:15 Ihe ọ dere nʼakwụkwọ ahụ bụ nke a, “Tinye Ụraya nʼihu agha ebe ọgụ siri ike. Mgbe ndị iro na-apụkwute unu, laanụ azụ, ma hapụnụ Ụraya nʼihu ọgụ ka ndị iro gbuo ya.”
2SA 11:16 Ya mere, mgbe Joab gbara obodo ahụ gburugburu, o tinyere Ụraya nʼebe ọ maara na ndị dị ike nʼetiti ndị iro ha nọ.
2SA 11:17 Ndị ikom obodo ahụ pụtara buso Joab agha. Ụfọdụ ndị agha Devid nwụrụ. Ụraya onye Het, so na ndị egburu.
2SA 11:18 Mgbe ahụ, Joab zigara ozi gwa Devid otu agha si na-aga,
2SA 11:19 Ọ gwara onyeozi ahụ sị, “Mgbe ị gwachara eze akụkọ ihe gbasara otu agha si gaa
2SA 11:20 iwe nwere ike iwe eze nke ukwu, na o nwere ike jụọ gị sị, ‘Gịnị mere unu ji gaa mgbidi obodo ahụ nso ịlụ agha? Ọ bụ na unu amaghị na a ga-esi nʼelu mgbidi ahụ gbaa àkụ?
2SA 11:21 Onye gburu Abimelek nwa Jeru-Beshet? Ọ bụghị na mgbidi obodo ka nwanyị nọ tụdaa aka nkume dagburu ya na Tebez? Gịnị mere unu ji jeruo mgbidi ahụ nso?’ Ọ bụrụ na ọ jụọ gị ihe dị otu a, gwa ya, ‘Ohu gị bụ Ụraya, onye Het anwụọkwala.’ ”
2SA 11:22 Onyeozi ahụ biliri ije, mgbe o rutere, ọ gwara Devid ihe niile Joab ziri ya ka o zie.
2SA 11:23 Onyeozi ahụ sịrị Devid, “Ndị ikom ahụ ji ike karịrị anyị, ha pụtara ị buso anyị agha na mbara ma anyị chụghachiri ha azụ. Chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ.
2SA 11:24 Mgbe ahụ, ndị ọgba ụta sitere nʼelu mgbidi malite ịgba ndị ohu gị àkụ, ụfọdụ nʼime ndị ikom eze nwụrụ. Ohu gị Ụraya, onye Het, sokwa na ndị nwụrụ.”
2SA 11:25 Devid sịrị onyeozi ahụ, “Otu a ka ị ga-agwa Joab, ‘Ka ihe a ghara iwute gị nʼobi, nʼihi na mma agha na-egbu otu onye dịka o si egbu onye ọzọ. Lụsie ọgụ ike, lụgbukwaa obodo ahụ.’ Jiri okwu ndị a gbaa ya ume.”
2SA 11:26 Mgbe nwunye Ụraya nụrụ na di ya anwụọla, o ruru ụjụ nʼihi ya.
2SA 11:27 Mgbe oge iru ụjụ ya gabigara, Devid ziri ka a kpọta ya nʼụlọeze. Ọ ghọkwara nwunye ya. Mụọra ya nwa nwoke. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị.
2SA 12:1 Ya mere, Onyenwe anyị zigara Netan ka o jekwuru Devid. Mgbe Netan bịakwutere Devid, ọ kọọrọ ya akụkọ a, “E nwere ndị ikom abụọ bi nʼotu obodo, otu bụ ọgaranya ma nke ọzọ bụ ogbenye.
2SA 12:2 Onye ọgaranya a nwere ọtụtụ igwe atụrụ na igwe ehi.
2SA 12:3 Ma nwoke ogbenye ahụ enweghị ihe ọbụla karịa otu nwa nne atụrụ nta nke ọ zụtara. Ọ zụlitere ya, o tolite nʼetiti ya na ụmụ ya. Ọ na-eri nri site na ihe oriri ya, na-aṅụ mmiri site nʼiko mmiri ya, nʼobi ya ka ọ na-edinakwa. Ọ nọ ọnọdụ dịka nwa nwanyị nye ya.
2SA 12:4 “Otu ụbọchị, onye ọbịa bịara nʼụlọ onye ọgaranya ahụ. Ma kama ọgaranya ahụ ga-ewere otu atụrụ maọbụ ehi nke ya siere onye ọbịa ya nri, ọ gara were nne atụrụ ogbenye ahụ, gbuo ya, jiri ya siere ọbịa ya nri.”
2SA 12:5 Devid were oke iwe megide nwoke ahụ, ọ sịrị Netan, “Ana m aṅụ iyi nʼaha Onyenwe anyị dị ndụ na onye mere ihe dị otu a aghaghị ịnwụ!
2SA 12:6 Ọ ga-ejikwa nwa atụrụ okpukpu anọ kwụghachi ogbenye ahụ ụgwọ otu atụrụ ahụ o weere, nʼihi na onye ọgaranya ahụ egosighị na o nwere obi ebere ọbụla.”
2SA 12:7 Mgbe ahụ, Netan sịrị Devid, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ! Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Mụ onwe m tere gị mmanụ ịbụ eze Izrel, mụ onwe m napụtakwara gị site nʼaka Sọl.
2SA 12:8 Enyere m gị ụlọ nna gị ukwu, nyefekwa ndị inyom nna gị ukwu nʼaka gị, na alaeze Izrel na Juda, ka ha bụrụ nke gị. Ma ọ bụrụ na nke a ezughị, agaara m atụkwasịrị gị ihe ndị a niile okpukpu okpukpu.
2SA 12:9 Gịnị mere i ji lelịa okwu Onyenwe anyị anya, mee ihe a jọgburu onwe ya? Nʼihi na i jirila mma agha gbuo Ụraya onye Het, zurukwa nwunye ya nʼohi. Ọ bụkwa mma agha ndị Amọn ka i ji gbuo ya.
2SA 12:10 Ya mere, nʼihi ihe a i mere, mma agha agaghị esi nʼezinaụlọ gị pụọ, nʼihi na i ledara m anya kpọrọ nwunye Ụraya onye Het ka ọ bụrụ nwunye gị.’
2SA 12:11 “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ si nʼezinaụlọ gị bilie megide gị. Nʼihu gị ka m ga-eduru ndị nwunye gị dunye otu onye dị gị nnọọ nso, ya na ha ga-edinakọ nʼehihie ọcha, nʼihu ndị Izrel niile.
2SA 12:12 I mere mmehie gị na nzuzo, ma aga m eme nke a na mbara, nʼihu Izrel niile.’ ”
2SA 12:13 Mgbe ahụ, Devid sịrị Netan, “Emehiela m megide Onyenwe anyị.” Netan zara sị ya, “Onyenwe anyị nʼonwe ya agbagharakwala gị mmehie gị, ị gaghị anwụ.
2SA 12:14 Ma nʼihi na i meela ka ndị iro Onyenwe anyị nwe ohere ikwulu na ilelị ya anya, nwa nwoke ahụ amụụrụ gị ga-anwụ.”
2SA 12:15 Mgbe Netan lara, Onyenwe anyị mere ka nwantakịrị ahụ nwunye Ụraya mụụrụ Devid daa ọrịa.
2SA 12:16 Devid rịọrọ Chineke arịrịọ banyere nwantakịrị ahụ. O buru ọnụ, dinaa nʼala efu abalị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị.
2SA 12:17 Emesịa, ndị okenye ụlọ ya rịọrọ Devid ka o bilie rie nri, ma ọ jụrụ iri ihe ọbụla.
2SA 12:18 Nʼụbọchị nke asaa, nwantakịrị ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, ndị na-ejere Devid ozi tụrụ egwu otu ha ga-esi gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla. Nʼihi na ha kwuru nʼime onwe ha sị, “Mgbe nwantakịrị ahụ ka dị ndụ, anyị gwara ya okwu ma o geghị anyị ntị. Anyị ga-esi aṅaa gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla? O nwere ike imerụ onwe ya ahụ.”
2SA 12:19 Mgbe Devid hụrụ na ha na-ekwurịta okwu nʼetiti onwe ha na nzuzo; ọ matara na nwa ahụ anwụọla. Ọ jụrụ ha sị, “Nwata ahụ ọ nwụọla?” Ha zara sị ya, “E, ọ nwụọla!”
2SA 12:20 Mgbe ahụ, Devid sitere nʼala ebe o dina, bilie, saa ahụ, gbanwee uwe ya, baa nʼụlọ Onyenwe anyị, kpọọrọ ya isiala. Ọ lọghachiri nʼụlọ ya nye iwu ka e wetara ya ihe oriri. O rikwara nri.
2SA 12:21 O juru ndị na-ejere ya ozi anya, nʼihi ya ha jụrụ ya ajụjụ si, “Gịnị mere i ji eme omume dị otu a? Mgbe nwantakịrị ahụ nọ ndụ, i buru ọnụ, kwaakwa akwa, ma ugbu a, nwa ahụ anwụọla, ị kwụsịla iru ụjụ. Ugbu a, ị biliela na-erikwa nri.”
2SA 12:22 Devid zara ha sị, “Eburu m ọnụ, kwaakwa akwa mgbe nwa ahụ nọ ndụ, nʼihi na ekwuru m sị, ‘ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-enwe ọmịiko nʼebe m nọ mee ka nwa ahụ dị ndụ.’
2SA 12:23 Ma ugbu a ọ nwụrụ, gịnịkwa ka m nwere dịka uru ibu ọnụ ọzọ? M pụrụ ime ka ọ dị ndụ ọzọ? Aga m alakwuru ya, ma ọ gaghị alaghachikwutekwa m.”
2SA 12:24 Devid kasiri Batsheba nwunye ya obi, emesịa, mgbe ya na ya dinakọrọ, ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke onye ha kpọrọ aha ya Solomọn. Ma Onyenwe anyị hụrụ nwantakịrị ahụ nʼanya.
2SA 12:25 O zigara ozi site nʼaka Netan, onye amụma, ka a gụọ ya Jedidaya nʼihi Onyenwe anyị.
2SA 12:26 Nʼoge a, Joab busoro Raba obodo ndị Amọn agha dọta isi obodo eze ha nʼagha.
2SA 12:27 Joab zigara Devid ozi sị ya, “Ebuola m agha megide Raba dọta isi mmiri ọṅụṅụ ya nʼagha.
2SA 12:28 Ugbu a chịkọtaa ndị agha fọdụrụ bịa lụpụchaa agha a, ka ị dọta obodo a nʼagha. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m adọta obodo a nʼagha, a ga-akpọkwasịkwa ya aha m.”
2SA 12:29 Nʼihi nke a, Devid duuru ndị agha Izrel jeruo Raba, buso ya agha, meriekwa ya.
2SA 12:30 Devid kpupuru okpueze nke dị nʼisi eze ha, e kpunye ya nʼisi nke ya onwe ya. Ịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma. Devid sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.
2SA 12:31 Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala na anyụike nʼarụ. O mere ka ha rụọ ọrụ nʼebe a na-akpụ blọk brik. Devid mekwara otu ihe a nʼobodo niile nke ụmụ Amọn. Emesịa, ya na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.
2SA 13:1 Absalọm nwa Devid nwere otu nwanne nwanyị mara mma, aha ya bụ Tama. Ma Amnọn, otu nʼime ụmụ ndị ikom Devid, hụrụ nwaagbọghọ a nʼanya.
2SA 13:2 Ma ịhụnanya a Amnọn hụrụ Tama nwanne ya nwanyị mere ya ka ọ daa ọrịa, nʼihi na ọ bụ ihe rara Amnọn ahụ ịchọpụta ụzọ ya na Tama ga-esi nwee mmekọ, ebe ọ bụ na Tama bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.
2SA 13:3 Ma Amnọn nwere otu enyi dị aghụghọ, onye aha ya bụ Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid.
2SA 13:4 Otu ụbọchị, Jonadab bịakwutere Amnọn jụọ ya sị, “Gịnị mere, gị bụ nwa eze ji na-ata ahụ ụtụtụ niile? Ọ bụ na ị gaghị akọrọ m?” Amnọn gwara ya sị, “Ahụrụ m Tama nʼanya, bụ nwanne Absalọm, nwanne m nwoke.”
2SA 13:5 Jonadab gwara ya sị, “Ọ dị mma. Lee ihe ị ga-eme. Gaa dinaa ala, dịka a ga-asị na ahụ adịghị gị. Mgbe nna gị bịara ileta gị, gwa ya okwu sị ya, ‘Achọrọ m ka nwanne m nwanyị bụ Tama bịa nye m ihe oriri. Achọrọ m ka ọ nọdụ nʼihu m sie nri ahụ, mgbe m na-ele ya anya, ka o jirikwa aka ya nye m nri ahụ.’ ”
2SA 13:6 Amnọn mere otu a. Mgbe eze bịara ileta ya, Amnọn rịọrọ ya sị, “Biko, ka Tama bịa ebe a gheere m achịcha ole na ole ebe m ga-ahụ ya anya. Ka o jirikwa aka ya dozie ya nʼihu m ka m rie ya.”
2SA 13:7 Devid kwenyere, zie Tama ka ọ gaa nʼụlọ Amnọn gaa siere ya nri.
2SA 13:8 Tama gara nʼụlọ Amnọn, banyekwa nʼime ụlọ ebe o dinaa, ka Amnọn na-ele ya anya mgbe ọ na-agwọgharị ụtụ ọka. Emesịa, Tama gheere ya achịcha mara mma.
2SA 13:9 Mgbe o cheziri achịcha ahụ nʼihu Amnọn, Amnọn jụrụ iri ya. Ihe o mere mgbe ahụ bụ inye ndị na-ejere ya ozi nọ nʼebe ahụ iwu sị ha niile pụọ ngwangwa. Ha niile pụkwara.
2SA 13:10 Mgbe ahụ, Amnọn gwara Tama okwu sị, “Ugbu a, wetara m nri ahụ nʼime ụlọ ndina m, bịa jiri aka gị nye m ya.” Tama bugaara ya achịcha ahụ nʼime ụlọ ebe ihe ndina ya dị.
2SA 13:11 Ma mgbe Tama guzo nʼihu ya, Amnọn jidere ya nʼike sị ya, “Bịa, soro m dinaa, nwanne m nwanyị.”
2SA 13:12 Tama zara sị ya, “Mba! Nwanne m nwoke. Emerụla m. Ihe dị otu a ekwesighị ime nʼala Izrel. Emela ihe ọjọọ dị otu a.
2SA 13:13 Olee ihe ga-abụ ọnọdụ m? Oleekwanụ ihe ga-abụ ọnọdụ gị? Olee ebe m ga-agbala izo onwe m nʼihi ihe ihere ga-adịrị m ma i mee ihe dị otu a? Ị ga-adị ka otu nʼime ndị nzuzu ọjọọ dị nʼIzrel. Biko, gwa eze, ọ ga-ekwe ka ị lụọ m.”
2SA 13:14 Ma Amnọn egeghị ntị. Ebe ọ bụ na ọ ka Tama ike, o jidere ya dinaa ya nʼike merụọ ya.
2SA 13:15 Emesịa, Amnọn kpọrọ Tama asị. Nʼezie, ọ kpọrọ ya asị ugbu a karịa ịhụnanya ọ hụrụ ya na mbụ. Ọ gwara Tama okwu sị ya, “Bilie si nʼebe a pụọ ọsịịsọ!”
2SA 13:16 Ma Tama kwara akwa sị ya, “Mba! Ịjụ m otu a ka njọ karịa ihe ọjọọ i mere m.” Ma Amnọn egeghị ya ntị.
2SA 13:17 Ọ kpọrọ nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Chụpụ nwanyị a nʼezi, kpachiere m ụzọ nʼazụ.”
2SA 13:18 Onyeozi ya chụpụrụ ya nʼezi, kpachie ụzọ nʼazụ ya. Uwe mwụda nwere aka ogologo ka Tama yi, nʼihi na ọ bụ ụdị nke ụmụ ndị inyom eze na-amaghị nwoke na-eyi.
2SA 13:19 Tama dọwara uwe mwụda ahụ o yi nʼahụ, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya nʼisi, buru aka ya nʼisi na-eti mkpu akwa dịka ọ na-ala.
2SA 13:20 Nwanne ya nwoke, Absalọm jụrụ ya sị, “Amnọn, nwanne gị nwoke, o dinakwuuru gị? Ma ugbu a, nwanne m, gba nkịtị, nwanne gị nwoke ka ọ bụ. Etinyela ihe a mere nʼobi.” Tama nọrọ dịka onye mmadụ niile jụrụ ajụ nʼụlọ nwanne ya nwoke, bụ Absalọm.
2SA 13:21 Mgbe eze Devid nụrụ ihe ndị a niile, iwe were ya nke ukwuu.
2SA 13:22 Absalọm agwaghị Amnọn okwu ọbụla, maọbụ nke dị mma, maọbụ okwu ọjọọ. Ma ọ kpọrọ Amnọn asị nke ukwuu nʼihi ọnọdụ iweda nʼala o wedara nwanne ya Tama, mee ya ihe ihere.
2SA 13:23 Mgbe afọ abụọ gasịrị, mgbe ndị na-akpụchara Absalọm ajị ụmụ atụrụ ya nọ na Baal-Hazọ, nʼoke ala Ifrem, ọ kpọkọtara ụmụ ndị ikom eze niile ka ha bịa nʼebe ahụ.
2SA 13:24 Absalọm jekwuuru eze sị ya, “Ndị na-akpụcha ajị ụmụ atụrụ ohu gị bịara. Eze na ndịisi ozi ya, ha ga-abịa sonyere m?”
2SA 13:25 Ma eze zara sị ya, “Mba, nwa m, anyị niile agaghị abịa, anyị ga-abụ ibu dị arọ nye gị.” Nʼagbanyeghị na Absalọm rugidere ya ma o kweghị aga, kama ọ gọziri ya.
2SA 13:26 Mgbe ahụ, Absalọm rịọrọ nna ya sị, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na ị gaghị abịa, ị ga-emekwa ka nwanna m nwoke Amnọn, na ụmụ eze ndị ọzọ bịa?” Eze jụrụ ya sị, “Nʼihi gịnị ka Amnọn ga-eji soro gị gaa?”
2SA 13:27 Ma Absalọm rụgidere ya, ya mere o zipụrụ Amnọn na ụmụ eze ndị ọzọ ka ha soro ya gaa.
2SA 13:28 Mgbe ahụ, Absalọm nyere ndị na-ejere ya ozi iwu banyere Amnọn sị, “Cherenụ ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, mgbe m sịkwara unu tigbuo ya, unu atụla egwu, tigbuonụ ya. Ọ bụ m na-ekwu ihe ga-eme nʼebe a. Nweenụ obi ike, meekwanụ ya.”
2SA 13:29 Mgbe oge ruru, ndị ozi Absalọm tigburu Amnọn. Mgbe ahụ, ụmụ eze niile biliri makwasị nʼịnyịnya ha gbalaga.
2SA 13:30 Mgbe ha ka nọ nʼụzọ na-agbaga Jerusalem, ozi eruolarị Devid ntị sị, “Absalọm egbuchaala ụmụ eze niile, ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ!”
2SA 13:31 Eze biliri ọtọ, dọwaa uwe ya, daa nʼala, gbatịa onwe ya nʼihi obi ọjọọ. Ndị na-ejere ya ozi dọwakwara uwe ha nʼihi egwu na obi ọjọọ.
2SA 13:32 Ma Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid, sịrị, “Onyenwe m, echekwala na e gburu ụmụ ndị ikom eze niile, kama ọ bụ naanị Amnọn! Nke a bụ ihe Absalọm jikere ime site mgbe Amnọn wakporo nwanne ya nwanyị bụ Tama, dina ya.
2SA 13:33 Ma ugbu a, ka onyenwe m bụ eze ghara itinye akụkọ banyere ọnwụ ụmụ ndị ikom eze niile, nʼobi ya. Ọ bụ naanị Amnọn nwụrụ.”
2SA 13:34 Ma Absalọm gbara ọsọ gbalaga. Ọ dịghị anya nwoke na-anọ nʼelu mgbidi Jerusalem na-eche nche, lepụrụ anya hụ ndị mmadụ ka ha si nʼụzọ dị nʼakụkụ ugwu nta na-abịa. Nwoke ahụ gara gwa eze sị ya, “Ahụrụ m ndị si nʼakụkụ Horonaim, nʼakụkụ ugwu na-abịa.”
2SA 13:35 Jonadab gwara eze sị, “Lee, ọ bụ ụmụ ndị ikom eze na-alọta dịka m kwuru.”
2SA 13:36 Mgbe ha lọbatara, ha bidoro ịkwa akwa nke ukwuu. Eze na ndị na-ejere ya ozi sokwa kwaa akwa.
2SA 13:37 Absalọm gbara ọsọ gbakwuru Talmai nwa Amihud, eze Geshua. Ma eze Devid ruru ụjụ nke ukwuu maka ọnwụ Amnọn.
2SA 13:38 Mgbe Absalọm gbara ọsọ gbaga Geshua, ọ nọrọ nʼebe ahụ afọ atọ.
2SA 13:39 Ọ gụrụ eze bụ Devid agụụ ịgakwuru Absalọm, nʼihi ọ kasịela obi maka ọnwụ Amnọn.
2SA 14:1 Joab, nwa Zeruaya matara na obi eze dị nʼebe Absalọm nọ.
2SA 14:2 Joab zigara ozi na Tekoa, si nʼebe ahụ kpọta otu nwanyị maara ihe. Mgbe nwanyị ahụ bịaruru, Joab gwara ya sị, “Mee onwe gị dịka onye na-eru ụjụ. Yiri akwa mkpe, etekwala mmanụ otite. Kpaa agwa dịka nwanyị nọ nʼiru ụjụ ogologo oge.
2SA 14:3 Emesịa, jekwuru eze, gwa ya okwu ndị a m na-agwa gị.” Joab tinyere okwu ndị ahụ nʼọnụ ya.
2SA 14:4 Mgbe nwanyị ahụ si Tekoa gara na nke eze, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala ịsọpụrụ eze. Ọ sịrị, “Biko nyere m aka, gị onye a na-asọpụrụ!”
2SA 14:5 Eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ mkpa gị?” Ọ zara sị, “Abụ m nwanyị isi mkpe, di m anwụọla.
2SA 14:6 Enwere m ụmụ ndị ikom abụọ ndị gara lụọ ọgụ nʼọhịa. Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ, o nweghị onye pụtara gboo ha. Nʼihi ya, otu nʼime ha tigburu ibe ya.
2SA 14:7 Ma ugbu a, ndị ikwu di m na-esogbu m na-asị ‘Kpọpụta onye ahụ gburu nwanne ya ka anyị gbuo ya nʼihi ndụ nwanne ya o wepụrụ, ka anyị si otu a memilaa onye nke fọdụrụ ga-erita oke ezinaụlọ.’ Ha chọrọ isi otu a menyụọ icheku ọkụ nke fọdụụrụ m, nke bụ na di m agaghị enwezikwa aha maọbụ onye fọdụụrụ ya nʼelu ụwa.”
2SA 14:8 Eze sịrị nwanyị ahụ, “Laa nʼụlọ gị, aga m ahụ na o nweghị onye metụrụ ya aka.”
2SA 14:9 Ma nwanyị ahụ si Tekoa sịrị ya, “Ka onyenwe m, bụ eze, gbaghara mụ na ezinaụlọ m, ka ikpe ọmụma ọbụla ghara ịdịrị eze na ocheeze ya.”
2SA 14:10 Eze zara ya, “Enyela onwe gị nsogbu maka nke ahụ. Ọ bụrụ na onye ọbụla agwa gị okwu ọbụla, kpọtara m ya. Onye dị otu a agaghị enyekwa gị nsogbu ọzọ.”
2SA 14:11 Mgbe ahụ ọ zara, “Biko, ka eze kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya ka ọ kwụsị onye na-agwa ọchụ, ka ọ ghara igbu onye ọzọ, ka a gharakwa ịla nwa m nwoke nʼiyi.” Ọ sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, otu agịrị isi agaghị esi nʼisi nwa gị dapụ nʼala.”
2SA 14:12 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ sịrị, “Biko kwere ka ohu gị nwanyị gwa onyenwe m eze otu mkpụrụ okwu ọzọ.” Ọ sịrị, “Gaa nʼihu kwuo.”
2SA 14:13 Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ nʼihi gịnị ka ị chere ihe dị otu a megide ndị nke Chineke? Mgbe eze na-ekwu otu a, ọ bụ na ọ dịghị ama onwe ya ikpe, nʼihi na eze a jụla ịkpọghachi nwa ya a chụpụrụ achụpụ?
2SA 14:14 Anyị niile ga-anwụ. Anyị dịkwa ka mmiri a wụsara nʼala, nke a na-apụghị ịchịkọtakwa ọzọ. Ma Chineke adịghị anapụ mmadụ ndụ ya, ma ọ na-emeghepụ ụzọ ga-eme ka onye ọ chụpụrụ achụpụ lọghachikwutekwa ya.
2SA 14:15 “Ma ugbu a, ebe m bịara ịgwa onyenwe m bụ eze, okwu a, nʼihi na ndị mmadụ emenyela m egwu. Ohu gị chere nʼobi ya, ‘Aga m agwa eze okwu; ma eleghị anya, ọ ga-emezuru ohu ya nwanyị ihe ọ rịọrọ.
2SA 14:16 Ma eleghị anya eze ga-anapụta ohu ya nwanyị site nʼaka nwoke ahụ na-agbalị ibipụ mụ na nwa m nwoke site nʼihe nketa nke Chineke.’
2SA 14:17 “Ugbu a, ohu gị nwanyị na-asị, ‘Ka okwu onyenwe m eze kwuru wetara m izuike, nʼihi onyenwe m eze na-enyochapụta ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ dịka mmụọ ozi Chineke. Ka Onyenwe anyị Chineke gị nọnyere gị.’ ”
2SA 14:18 Mgbe ahụ, eze gwara nwanyị ahụ okwu sị, “Achọrọ m ka ị gwa m eziokwu nʼajụjụ a m na-aga ịjụ gị.” Nwanyị ahụ zara sị, “Ka onyenwe m, bụ eze kwuo ihe dị ya nʼobi.”
2SA 14:19 Devid jụrụ ya sị, “Aka Joab ọ dị nʼokwu ndị a niile?” Nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka ị na-adị ndụ, onyenwe m, bụ eze, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi nʼihe onyenwe m bụ eze kwuru, chee ihu nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. E, ọ bụ ohu gị Joab nyere m iwu ime nke a, ya gwakwara ohu gị nwanyị okwu niile ndị a.
2SA 14:20 Ohu gị bụ Joab mere ihe a ka ọ gbanwee otu ọnọdụ ihe dị ugbu a. Onyenwe m nwere amamihe dịka ndị mmụọ ozi Chineke. Ọ maakwara ihe niile na-eme nʼala.”
2SA 14:21 Eze sịrị Joab, “Ọ dị mma, aga m eme ya. Gaa kpọghachite nwokorobịa ahụ bụ Absalọm.”
2SA 14:22 Joab dara nʼala kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala, gọzie eze. Joab sịrị, “Taa ka ohu gị maara na ahụtala m amara nʼihu gị, onyenwe m bụ eze, nʼihi na eze e merela ohu ya ihe ọ rịọrọ.”
2SA 14:23 Joab biliri gaa Geshua, kpọlata Absalọm na Jerusalem.
2SA 14:24 Mgbe ha bịaruru, eze gwara Joab okwu sị, “Gwa ya ka ọ laa nʼụlọ ya. Ọ gaghị abịa nʼihu m, nʼihi na-achọghị m ịhụ ya anya.” Ya mere, Absalọm lara nʼụlọ ya. Ọ hụkwaghị eze anya.
2SA 14:25 Ọ dịghị nwoke mara mma dịka Absalọm nʼala Izrel niile. Ọ dịkwaghị onye na-adịghị ekwu okwu banyere ịma mma ya. Nʼihi na ntụpọ ọbụla adịghị ya nʼahụ site nʼopi isi ya ruo nʼọbọ ụkwụ ya.
2SA 14:26 Mgbe ọbụla ọ kpụchara ntutu isi ya, nʼihi na ọ bụ otu ugboro nʼafọ ka ọ na-akpụcha agịrị isi mgbe o bidoro ịnyị ya arọ. Ọ na-atụ agịrị isi a na-akpụchapụta ya nʼisi, ịdị arọ ya na-eru narị shekel abụọ ma a tụọ ya nʼihe ọtụtụ eze.
2SA 14:27 Absalọm mụtara ụmụ ndị ikom atọ, na otu nwanyị, aha ya bụ Tama. Nwaagbọghọ a mara mma nke ukwuu.
2SA 14:28 Mgbe Absalọm nọrọ afọ abụọ na Jerusalem na-ahụghị eze anya,
2SA 14:29 o ziri ozi ka Joab bịa, ka ọ gaa ziere ya eze ozi, ma Joab abịaghị. Absalọm zigakwara ozi ọzọ ka ọ bịa ma Joab ekweghị ịbịa.
2SA 14:30 Nʼikpeazụ, Absalọm gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Gaanụ sunye ubi ọka balị Joab dị nʼakụkụ nke m ọkụ.” Ha mekwara dịka a gwara ha.
2SA 14:31 Mgbe ahụ, Joab biliri jee nʼụlọ Absalọm, ma sị ya, “Gịnị mere ndị na-ejere gị ozi ji gbaa ubi m ọkụ?”
2SA 14:32 Absalọm sịrị ya, “Lee ezitere m gị ozi, sị, ‘Bịa nʼebe a ka m ziga gị na nke eze ka ị jụta, “Nʼihi gịnị ka m ji site na Geshua lọghachita? Ọ gara a kara m mma ma a sị na m nọ nʼebe ahụ ruo ugbu a.” ’ Ugbu a, achọrọ m ka mụ hụ ihu eze, ọ bụrụ na onwe ajọ omume dị nʼime m, ya mee ka m nwụọ.”
2SA 14:33 Joab gakwuru eze, gwa ya ihe Absalọm kwuru. Mgbe ahụ, eze kpọrọ Absalọm, onye batara ma kpọọ isiala nʼihu eze. Eze sutukwara ya ọnụ.
2SA 15:1 Mgbe nke a gasịrị, Absalọm zụtaara onwe ya ụgbọ agha na ịnyịnya na-adọkpụ ya. O nwetakwaara onwe ya iri ndị ikom ise ndị na-agba ọsọ nʼihu ya.
2SA 15:2 Nʼisi ụtụtụ, ọ na-ebili gaa guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata Jerusalem. Ọ bụrụ na ọ hụ onye ọbụla nwere okwu ọ chọrọ ka eze mara ihe banyere ya, Absalọm na-akpọ onye ahụ jụọ ya sị, “Olee obodo i si bịa?” Onye ahụ na-aza sị, “Ohu gị si nʼotu nʼime ebo dị nʼIzrel.”
2SA 15:3 Absalọm na-agwa onye ahụ sị, “Ahụrụ m na okwu gị niile bụ eziokwu. Ma ọ na-ewute m na eze enweghị onye na-enyere ya aka ịnụ okwu ndị a niile.”
2SA 15:4 Absalọm na-ekwukwa sị, “Asị na m bụ onye ikpe nʼala Izrel, onye ọbụla nwere okwu na ụka gaara abịakwute m ka m mee ka ikpe ziri ezi rute ya aka.”
2SA 15:5 Mgbe onye ọbụla bịara ịkpọ isiala nye ya nʼọnọdụ nsọpụrụ, ọ na-eseti aka ya, jide onye ahụ sutu ya ọnụ.
2SA 15:6 Otu a ka Absalọm sị na-akpaso ndị Izrel agwa, bụ ndị ahụ niile na-abịakwute eze na-arịọ maka ikpe ziri ezi. O si otu a zuru obi ndị Izrel niile nʼohi.
2SA 15:7 Mgbe afọ anọ gasịrị, Absalọm bịakwutere eze rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m jee Hebrọn mezuoro Onyenwe anyị nkwa m kwere ya.
2SA 15:8 Mgbe ohu gị bi na Geshua nʼime Aram, ekweere m nkwa a, ‘Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ga-eme ka m lọghachi ọzọ na Jerusalem, aga m efe ya ofufe na Hebrọn.’ ”
2SA 15:9 Eze sịrị ya, “Gaa nʼudo.” Ya mere, ọ pụrụ gaa Hebrọn.
2SA 15:10 Mgbe ahụ, Absalọm zigara ndị ozi na nzuzo, ka ha gaa nʼebo niile nke ala Izrel. Nke a bụ ihe o ziri ha, “Mgbe unu nụrụ ụda opi ike, tienụ mkpu sị, ‘Absalọm abụrụla eze na Hebrọn.’ ”
2SA 15:11 Narị mmadụ abụọ si Jerusalem soro Absalọm gaa dịka ndị ọ kpọrọ oku oriri ma ha amaghị ihe ọbụla.
2SA 15:12 Mgbe Absalọm nọkwa na-achụ aja ahụ, o ziri ozi ka a kpọọ Ahitofel onye Gailo, otu nʼime ndị na-adụ Devid ọdụ, ka o si Gailo bịa nke bụ obodo ya. Nke a mere ka nkwekọrịta nzuzo ọjọọ ahụ na-esi ike karịa, ndị dịnyere Absalọm na-amụbanyekwa.
2SA 15:13 Ọ dịghị anya, onyeozi bịaruru Jerusalem gwa Devid na ndị Izrel niile kwagidere Absalọm.
2SA 15:14 Mgbe ahụ, Devid gwara ndị ọrụ ya niile ndị ya na ha nọ na Jerusalem, sị, “Bilienụ! Anyị aghaghị ịgbapụ, ma ọ bụghị otu a, ọ dịghị onye nʼime anyị ga-agbanarị Absalọm. Anyị ga-ahapụ ugbu a, ma ọ bụghị ya, ọ ga-eme ngwa gafee anyị wetara anyị mbibi, werekwa mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo a.”
2SA 15:15 Ndị na-ejere ya ozi zara sị ya, “Anyị dịnyere gị! Anyị jikekwara ime ihe ọbụla onyenwe anyị eze kwuru.”
2SA 15:16 Ya mere, eze na ndị ụlọ ya niile si na Jerusalem pụọ. Ọ dịghị onye ọ hapụrụ karịakwa ndị iko ya nwanyị iri nʼihi ilekọta obieze ahụ.
2SA 15:17 Eze biliri pụọ, ya na ndị niile so ya, ha kwụsịrị nʼoke ala nke obodo ahụ.
2SA 15:18 Ndị niile na-ejere ya ozi, gafere nʼakụkụ ya, ha na ndị Keret na Pelet, na narị ndị ikom isii ndị Git, bụ ndị so ya site na Gat, gafekwara nọrọ nʼihu eze.
2SA 15:19 Mgbe ahụ, Devid tụgharịrị kpọọ Itai, onye Git, ọchịagha narị ndị agha isii ahụ sị ya, “Gịnị mere i ji eso m? Laghachi azụ soro eze Absalọm, nʼihi na ị bụ ọbịa nʼIzrel, onye gbatara ọsọ ndụ.
2SA 15:20 Ọ dịbeghị anya kemgbe ị bịara. M ga-esi aṅaa kwere ka i soro m na-awagharị, ebe ọ bụ na m amaghị ebe m na-aga. Chịrị ndị agha gị laghachi. Ka obiọma na ikwesi ntụkwasị obi dịnyere unu.”
2SA 15:21 Ma Itai zara eze sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, onyenwe m na-adịkwa ndụ, ebe ọbụla onyenwe m bụ eze ga-anọ, ma ọ pụtara ndụ maọbụ ọnwụ, nʼebe ahụ ka odibo gị ga-anọkwa.”
2SA 15:22 Devid sịrị Itai, “Gaa nʼihu, gabiga.” Ya mere Itai, onye Git gabigara ya na ndị ikom ya niile, na ezinaụlọ niile ndị so ya.
2SA 15:23 Obodo niile tiri mkpu akwa mgbe ndị ahụ niile na-agabiga. Eze gafere ọdọ mmiri Kidrọn, ya na ndị mmadụ niile chere ihu nʼụzọ ọzara.
2SA 15:24 Zadọk bịakwara, ya na ndị Livayị niile, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ha dọbara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼala. Abịata chụgidere aja tutu ruo mgbe mmadụ niile sitere nʼobodo ahụ gabigasịrị.
2SA 15:25 Mgbe ahụ, eze sịrị Zadọk, “Bughachi igbe Chineke a nʼime obodo. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼanya Onyenwe anyị, ọ ga-akpọghachi m mee ka m hụ ya, na ebe obibi ya anya ọzọ.
2SA 15:26 Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ihe banyere gị adịghị atọkwa m ụtọ,’ lee m, ya mee m otu o si dị ya mma nʼanya.”
2SA 15:27 Mgbe ahụ, eze gwara Zadọk bụ onye nchụaja sị, “Ọkwa ị bụ onye ọhụ ụzọ? Laghachi nʼobodo nʼudo, kpọrọ Ahimaaz nwa gị nwoke, na Jonatan nwa Abịata. Gị na Abịata kpọrọ ụmụ unu ndị ikom abụọ ndị a laghachi nʼobodo.
2SA 15:28 Aga m akwụsị chere nʼebe e si akwọfe osimiri Jọdan, ruo mgbe ozi ga-esi nʼebe ị nọ bịa.”
2SA 15:29 Mgbe ahụ, Zadọk na Abịata bughachiri igbe Chineke na Jerusalem. Ha nọdụkwara nʼebe ahụ.
2SA 15:30 Ma Devid na ndị so ya chere ihu irigo Ugwu Oliv. Mgbe ọ na-aga, Devid nọ na-akwa akwa. O yikwaghị ihe ọbụla nʼụkwụ ya, ma o ji ihe kpuchie isi ya. Ndị niile so ya kpuchikwara isi ha na-akwakwa akwa ka ha na-arịgo.
2SA 15:31 Mgbe a gwara Devid na Ahitofel onye na-adụ ya ọdụ dịnyere Absalọm, Devid kpere ekpere sị, “O Onyenwe anyị, biko, tụgharịa ndụmọdụ Ahitofel ka ọ bụrụ ndụmọdụ nzuzu.”
2SA 15:32 Mgbe Devid bịaruru nʼelu Ugwu Oliv, ebe ndị mmadụ na-anọ na-efe Chineke ofufe, Hushaị, onye Akai nọ nʼebe ahụ na-eche izute ya. Uwe ya dọwakwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi.
2SA 15:33 Ma Devid sịrị ya, “Ọ bụrụ na i soro m, ị ga-abụ ibu arọ nye m.
2SA 15:34 Ma ọ bụrụ na ị laghachi nʼobodo, sị Absalọm, ‘Aga m abụ ohu gị, eze. Abụ m ohu nna gị nʼoge gara aga, ugbu a aga m abụ ohu gị.’ Nʼụzọ dị otu a ị ga-enyere m aka mebie ndụmọdụ Ahitofel.
2SA 15:35 Ọ bụ na Zadọk na Abịata ndị nchụaja agaghị eso gị nọdụ nʼebe ahụ? Gwa ha ihe ọbụla ị ga-anụta nʼụlọeze.
2SA 15:36 Ụmụ ha ndị ikom, Ahimaaz nwa Zadọk na Jonatan nwa Abịata so ha nọdụ nʼebe ahụ. Zitere m ha ka ha gwa m ihe ọbụla ị nụtara.”
2SA 15:37 Ya mere Hushaị, enyi Devid, bịarutere Jerusalem mgbe Absalọm na-abata obodo ahụ.
2SA 16:1 Mgbe Devid gafechara elu ugwu ahụ na-agbada nʼakụkụ nke ọzọ ya, Ziba, onye na-elekọta akụ Mefiboshet, guzo na-eche ya. Ọ chị ịnyịnya ibu bu narị ogbe achịcha abụọ, na otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị ụyọkọ mkpụrụ osisi ndị ọzọ, na karama akpụkpọ buru ibu mmanya juru nʼime ya.
2SA 16:2 Eze jụrụ Ziba sị, “Gịnị mere i ji bute ihe ndị a?” Ziba zara sị, “Ịnyịnya ibu ndị a bụ nke ndị ụlọeze ga-anọkwasị. Achịcha na mkpụrụ osisi ndị a bụ nke ndị ikom gị ga-eri. Mmanya a bụ nke ndị na-ada mba nʼọzara ga-aṅụ.”
2SA 16:3 Eze jụrụ ya sị, “Ebeekwanụ ka nwa nna gị ukwu nọ?” Ziba zara ya sị, “Ọ nọ na Jerusalem nʼihi na ọ sịrị, ‘Taa ụlọ Izrel ga-enyeghachi m alaeze nna nna m.’ ”
2SA 16:4 Eze gwara Ziba sị ya, “Nʼihi ya, enyela m gị ihe niile Mefiboshet nwere, ha ga-abụkwa nke gị.” Ziba sịrị, “Ka m hụta amara nʼihu eze, bụ onyenwe m.”
2SA 16:5 Dịka eze bụ Devid na-abịaru obodo Bahurim, lee, otu nwoke sitere nʼagbụrụ ụlọ Sọl sitere nʼebe ahụ pụta. Ọ bụ Shimei nwa Gera. Ọ na-akọcha mgbe ọ na-apụta ya.
2SA 16:6 Ọ chịịrị nkume na-atụ Devid na ndị ozi eze niile. Ọ bụ ezie na ndị agha Izrel na ndị na-eche Devid nche gbara ya gburugburu nʼaka nri na aka ekpe.
2SA 16:7 Ma dịka Shimei na-akọcha, ọ sịrị, “Si nʼebe a pụọ, si nʼebe a pụọ, gị ogbu mmadụ, gị onye ọjọọ!
2SA 16:8 Onyenwe anyị akwụghachila gị ụgwọ ọbara niile ị wụsiri nʼezinaụlọ Sọl, onye ị nọchiri ọnọdụ ya dịka eze. Onyenwe anyị anapụla gị alaeze ahụ, were ya nye Absalọm nwa gị! Ugbu a, ihe i metara abịala gị ụgwọ, gị ogbu mmadụ.”
2SA 16:9 Abishai, nwa Zeruaya gwara eze okwu sị, “Nʼihi gịnị ka nkịta a nwụrụ anwụ ga-eji na-akọcha onyenwe m bụ eze? Biko, ka m gafee gaa bipụ ya isi.”
2SA 16:10 Ma eze zara sị, “Gịnị jikọrọ mụ na unu, unu ụmụ ndị ikom Zeruaya. Ọ bụrụ na ọ na-akọcha m nʼihi na Onyenwe anyị sị ya ‘Kọchaa Devid,’ onye pụrụ ịjụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere ị ji na-eme ihe dị otu a?’ ”
2SA 16:11 Mgbe ahụ, Devid gwara Abishai na ndị ozi ya okwu sị, “Nwa m nwoke, onye si nʼahụ m na-agbalị ịnapụ m ndụ m. Gịnị ga-eme ka onye Benjamin a ghara ime karịa? Hapụ ya, ya kọchaa, nʼihi na Onyenwe anyị agwala ya ka ọ kọchaa m.
2SA 16:12 Ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-ahụ ọnọdụ ahụhụ m, nyeghachikwa m ngọzị nʼọnọdụ nkọcha ndị a.”
2SA 16:13 Ya mere, Devid na ndị ya gakwara nʼihu ije ha nʼụzọ ahụ ma Shimei sokwara ha na-aga nʼakụkụ ugwu ahụ na-akọcha ha. Ọ nọgidekwara na-atụ Devid nkume, na-ekpolikwa aja elu ka ọ na-awụsa ha nʼahụ.
2SA 16:14 Ya mere, eze na ndị niile so ya gagidere bịaruo nʼakụkụ Jọdan nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ. Nʼihi ya, ha nọdụrụ nʼebe ahụ zuo ike.
2SA 16:15 Ma Absalọm na ndị Izrel abatalarị Jerusalem. Ahitofel sokwa ya.
2SA 16:16 Mgbe Hushaị, enyi Devid, onye Akai bịaruru, ọ gara hụ Absalọm sị ya, “Ka eze dị ogologo ndụ, ka eze dị ndụ.”
2SA 16:17 Absalọm sịrị Hushaị, “Ọ bụ otu a ka i si egosi ịhụnanya i nwere na-ebe enyi gị nọ? Gịnị mere i soghị ya?”
2SA 16:18 Hushaị zara Absalọm sị, “Mba! Onye ahụ Onyenwe anyị na ọha mmadụ na ndị Izrel niile họpụtara, nke onye ahụ ka m ga-abụ. Ọ bụkwa onye ahụ ka m ga-adịnyere.
2SA 16:19 Ma onye kwanụ ka m kwesiri ijere ozi? Ọ bụghị nwa eze? Ejeere m nna gị ozi, ugbu a anọkwa m jikere ijere gị ozi!”
2SA 16:20 Absalọm tụgharịrị gwa Ahitofel okwu sị, “Gịnị ọzọ ka m ga-eme? Nye anyị ndụmọdụ gị. Gịnị ka anyị kwesiri ime?”
2SA 16:21 Ahitofel zara, “Ga dinaa ndị iko nwanyị nna gị ndị ahụ ọ hapụrụ ka ha lekọtaa ụlọ. Mgbe ahụ, Izrel niile ga-anụ na ị meela onwe gị ihe na-asọ oyi nʼebe nna gị nọ, aka ndị niile nọnyere gị ga-akwụkwa chịm.”
2SA 16:22 Ya mere, ha manyeere Absalọm ụlọ ikwu nʼelu ụlọ; ọ kpọkwaara ndị iko nwanyị nna ya dinaa ha nʼotu nʼotu, nʼihu ndị Izrel niile.
2SA 16:23 Nʼoge ahụ, ndụmọdụ ọbụla Ahitofel dụrụ dị ka a ga-asị na ọ bụ ozi si nʼọnụ Chineke nʼonwe ya bịa. Ọ bụladị nʼebe Devid nọ, na nʼebe Absalọm nọkwa, otu a ka esi bulie ndụmọdụ ọbụla Ahitofel nyere elu.
2SA 17:1 Ahitofel gwara Absalọm sị ya, “Kwere ka m họpụta puku ndị ikom iri na abụọ ka m duru ha chụso Devid ọsọ nʼazụ nʼabalị taa.
2SA 17:2 Aga m abịakwasị ya mgbe ike gwụrụ ya, mgbe obi ya na-ada mba. Aga m emenye ya egwu nke ga-eme ka ọ maa jijiji. Mgbe ahụ, ndị niile so ya ga-agbasasịkwa. Ọ bụ naanị eze ka m ga-egbu
2SA 17:3 Aga m eme ka ndị ya niile lọghachikwute gị. Ọnwụ nke otu nwoke a ị na-achọsi ndụ ya ike ga-eme ndị ọzọ niile ịlọghachikwute gị, onye ọbụla ga-anọ nʼudo.”
2SA 17:4 Atụmatụ ahụ ziri ezi nʼanya Absalọm na ndị okenye niile nke Izrel.
2SA 17:5 Ma Absalọm kwuru sị, “Kpọọ Hushaị onye Akai ka anyị jụọ ya ihe ọ chere banyere okwu a.”
2SA 17:6 Mgbe Hushaị bịakwutere ya, Absalọm sịrị ya, “Ahitofel nyere ndụmọdụ dị otu a. Gịnị ka ị chere? Anyị ga-eme ihe o kwuru? Ọ bụrụ na anyị agaghị eme ya, gị onwe gị kwuo nke gị.”
2SA 17:7 Hushaị zara Absalọm sị, “Ndụmọdụ Ahitofel dụrụ nʼoge a adịghị mma.
2SA 17:8 Ọ sịrị, Gị onwe gị maara nna gị na ndị ikom ya; ha bụ ndị dike nʼagha, mkpụrụobi ha dịkwa ilu ugbu a dịka anụ ọhịa bịa a gbabara aka nwa nʼọhịa. Nna gị bụ onye ihe banyere agha doro anya. Ọ gaghị eso ndị ya nọọ ọnọdụ abalị.
2SA 17:9 Ọ bụladị ugbu a, o zoola onwe ya nʼime otu olulu maọbụ nʼime ọgba nkume. Ọ bụrụ na ọ pụta buru ụzọ buso ndị agha gị agha, onye ọbụla nụrụ ya ga-ekwu sị, ‘Etigbuola ndị agha Absalọm oke ntigbu.’
2SA 17:10 Mgbe ahụ, ọ bụladị dimkpa nʼagha ndị nwere obi ọdụm, ụjọ ga-atụkwa ha. Ha agaghị ekwekwa ịga nʼihu ọgụ. Nʼihi na Izrel niile maara na nna gị bụ dike. Ha maakwara na ndị agha ya bụkwa ndị obi kara aka.
2SA 17:11 “Ndụmọdụ m na-enye bụ nke a: chịkọtaa ndị Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, ha dịka aja nke dị nʼakụkụ oke osimiri. Ọ bụkwa gị ga-edu ha nʼagha ahụ.
2SA 17:12 Mgbe ahụ, anyị ga-ebuso ya agha ebe ọbụla anyị hụrụ ya; anyị ga-abịakwasị ya dịka igirigi si adakwasị ala. Anyị ga-egbu ya, gbukwaa ndị niile so ya. Otu onye agaghị afọdụkwa nʼime ha.
2SA 17:13 Ọ bụrụkwa na o zoo onwe ya nʼotu obodo, mgbe ahụ Izrel niile ga-eweta ụdọ nʼobodo ahụ, anyị ga-adọtu ya dọbanye ya na ndagwurugwu, ruo mgbe ọ bụladị otu nkume ga-afọdụ nʼebe ahụ.”
2SA 17:14 Absalọm na ndị ikom Izrel niile sịrị, “Ndụmọdụ Hushaị, onye Akai dị mma karịa nke Ahitofel.” Ma Onyenwe anyị ekpebielarị imebi ezi ndụmọdụ Ahitofel ka o si otu a wetara Absalọm ihe ndakwasị ọjọọ.
2SA 17:15 Hushaị gwara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja, “Otu a na ihe ndị a ka Ahitofel dụrụ Absalọm na ndị okenye Izrel nʼọdụ ka ha mee, ma otu a na nke a ka mụ onwe dụkwaranụ nʼọdụ.
2SA 17:16 Ugbu a, meenụ ngwa, ziga ozi gwa Devid sị, ‘Anọkwala ọnọdụ abalị nʼụzọ ngabiga nke osimiri nʼime ọzara, kama gabiga na-atụfughị oge, ma ọ bụghị otu a, ma eze ma ndị niile ya na ha soo ga-abụ ndị elodara.’ ”
2SA 17:17 Jonatan na Ahimaaz nọ nʼakụkụ En-Rogel ka a ghara ihu ha mgbe ha na-abata nʼobodo. Otu nwaagbọghọ na-eje ozi na-aga zie ha ozi, ha onwe ha agaa zie eze Devid.
2SA 17:18 Ma otu nwokorobịa hụrụ ha gaa gwa Absalọm. Ya mere, ha abụọ mere ngwangwa baa nʼụlọ otu nwoke onye Bahurim, onye nwere olulu mmiri nʼogige ya, ha rịdara nʼime olulu ahụ
2SA 17:19 Nwunye nwoke ahụ weere ihe mkpuchi ya tụsaa nʼọnụ olulu mmiri ahụ gbasaakwa mkpụrụ ọka nʼelu ya. Ọ dịghị onye maara maka ya.
2SA 17:20 Mgbe ndị ozi Absalọm bịaruru jụọ nwanyị ahụ, “Olee ebe Ahimaaz na Jonatan nọ”? Nwanyị ahụ zara, “Ha agafeela mmiri iyi.” Ndị ozi Absalọm chọrọ ha ma ha ahụghị ha. Ha laghachiri na Jerusalem.
2SA 17:21 Mgbe ha lawara, mmadụ abụọ ahụ sitere nʼolulu mmiri ahụ rigopụta, gaa gwa eze Devid. Ha sịrị ya, “Bilie gafeenụ mmiri ngwangwa, nʼihi na Ahitofel adụọla Absalọm ọdụ otu a na otu a megide gị.”
2SA 17:22 Nke a mere Devid na ndị niile so ya biliri gafee osimiri Jọdan. Mgbe chi ụtụtụ na-abọ, ha niile nọ nʼofe nke ọzọ Jọdan.
2SA 17:23 Mgbe Ahitofel hụrụ na-emeghị ndụmọdụ ya, o biliri jikwaa ịnyịnya ibu ya, laa nʼụlọ ya nʼobodo ya. Mgbe o ruru nʼụlọ ya, o doziri nʼezinaụlọ ya nʼusoro, were ụdọ kwụgbuo onwe ya. Ọ nwụrụ. E lie ya nʼili nna ya.
2SA 17:24 Devid batara Mahanaim oge Absalọm gabigara Jọdan, ya na ndị ikom Izrel so ya.
2SA 17:25 Absalọm họpụtakwara Amasa mee ya onyeisi ndị agha, nʼọnọdụ Joab. Amasa bụ nwa nwoke Itra, onye Ishmel, onye lụrụ Abigel, nwa nwanyị Nahash, onye bụkwa nwanne nwanyị Zeruaya nne Joab.
2SA 17:26 Absalọm na ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼala Gilead.
2SA 17:27 Mgbe Devid bịarutere Mahanaim, Shobi nwa Nahash onye obodo Raba nke dị nʼala ndị Amọn, na Makia nwa Amiel onye si Lo Deba, na Bazilai, onye Gilead si Rogelim
2SA 17:28 wetara ute e ji edina ala, na ite isi nri, na efere e ji eri nri bụ ọrụ onye ọkpụ ite. Tinyere ọka wiiti na ọka balị, ụtụ ọka na ọka a ṅara nʼọkụ, akịdị na lentil.
2SA 17:29 O wetakwara mmanụ aṅụ, na bọta, atụrụ na chiizi nke sitere na mmiri ara ehi nye Devid na ndị so ya ka ha rie. Nʼihi na ha sịrị, “Ike agwụla ndị mmadụ, agụụ na-agụ ha, akpịrị na-akpọkwa ha nkụ, nʼime ọzara.”
2SA 18:1 Devid gụkọtara ndị ya na ha so ma họpụta ndịisi agha. Doo ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ puku ndị agha, ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ narị ndị agha.
2SA 18:2 Devid zipụrụ ndị agha ya, otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nʼokpuru Joab, Ọ họpụtakwara Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, ka ọ chịa otu ụzọ. Ma otu ụzọ nke fọdụrụ ka o tinyere nʼaka Itai onye Gat. Eze gwara ndị agha ahụ sị, “Mụ onwe m ga-edu unu gaa agha.”
2SA 18:3 Ma ndị ikom ahụ sịrị, “Ị gaghị apụkwa ọzọ nʼihi na ọ bụrụ na anyị atụgharịa bido ịgba ọsọ, ọ bụrụkwa na otu ọkara nʼime anyị anwụọ, nke ahụ agaghị emetụ ha nʼobi. Naanị gị ka ha na-achọ. Ị dịkwa mkpa karịa puku ndị agha iri. Ọ ga-akara anyị mma ugbu a ka ị na-ezitere anyị inyeaka site nʼime obodo.”
2SA 18:4 Eze zara nʼikpeazụ sị, “Ihe ọbụla dị mma nʼanya unu ka m ga-eme.” Ya mere, eze guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dịka ndị ikom ya niile na-apụ nʼusu nke ọtụtụ narị, nakwa nʼusu nke ọtụtụ puku.
2SA 18:5 Eze nyere ndịisi agha ya, bụ Joab, Abishai na Itai, iwu sị ha, “Bikonu, nʼihi m, werenụ nwayọọ nʼebe nwokorobịa ahụ bụ Absalọm nọ.” Ndị agha niile nụkwara mgbe eze nyere ndịisi niile iwu a banyere Absalọm.
2SA 18:6 Ndị agha Devid si nʼobodo pụọ izute ndị Izrel nʼagha. Alụrụ agha a nʼọhịa Ifrem.
2SA 18:7 Ndị agha Devid tigbukwara ndị agha Izrel. Ha gburu iri puku ndị agha abụọ nʼụbọchị ahụ.
2SA 18:8 Agha ahụ gbasara nʼelu ala ahụ niile. Ndị nwụrụ nʼọhịa nʼetiti ụmụ Izrel karịrị ndị e gburu egbu.
2SA 18:9 Absalọm zutere ndị agha Devid. Ọ na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ya nʼoge a, dịka ịnyịnya ahụ sitere nʼokpuru osisi ook ukwu dị nʼọhịa ahụ na-agbafee, agịrị isi ya konyere nʼalaka osisi ahụ, tụhịkọtaakwa, nke mere na ọ kwụrụ nʼetiti eluigwe na ala. Ma ịnyịnya ya gbaara na-aga.
2SA 18:10 Otu nʼime ndị ikom ahụ hụrụ ya, kọọrọ Joab, “Lee, ahụrụ m Absalọm ebe ọ kwụ nʼelu osisi ook.”
2SA 18:11 Joab sịrị nwoke ahụ onye gwara gị, “Gịnị, ị hụrụ ya? Gịnị mere i tigbughị ya ka o ruo nʼala nʼebe ahụ? Mgbe ahụ, agaara m enye gị shekel ọlaọcha iri, na belịt a na-enye onye bụ dike nʼagha.”
2SA 18:12 Ma nwoke ahụ zara sị, “A sịkwarị na e nyere m puku ọlaọcha nʼaka m a, agaraghị m egbu ya. Nʼihi na anyị niile nụrụ mgbe eze na-agwa gị na Abishai na Itai sị, ‘Lezienụ anya banyere nwokorobịa bụ Absalọm, nʼihi m.’
2SA 18:13 A sị na m gburu ya, ọ ga-abụ imegide eze. Ọ ga-emesiekwa chọpụta onye mere ya. Ma gị onwe gị agaraghị apụta kwuchite ọnụ m.”
2SA 18:14 Joab sịrị, “Ọ bụghị otu a ka m ga na-eche nʼihu gị.” Ya mere, ọ chịịrị ùbe atọ nʼaka ya, dubaa ha nʼobi Absalọm, mgbe Absalọm ka dị ndụ makwụrụ nʼelu osisi ook.
2SA 18:15 Ụmụ okorobịa iri ndị na-ebu ihe agha Joab gbara Absalọm gburugburu, tigbuo ya.
2SA 18:16 Emesịa, Joab fụrụ opi ike nke mere ka ndị agha Devid na-achụ ndị Izrel kwụsị ịchụ ha ọsọ, nʼihi na Joab kwụsịrị ha.
2SA 18:17 Ha buuru ozu Absalọm tụba ya nʼolulu ukwu dị nʼoke ọhịa ahụ, werekwa nkume tụọ ya nʼelu. Ndị agha Izrel niile gbalara nʼụlọ ha.
2SA 18:18 Nʼoge Absalọm dị ndụ, o wuuru onwe ya ogidi ncheta. O wuru ogidi a na Ndagwurugwu Eze, nʼihi na o chere nʼime onwe ya sị, “Enweghị m nwa nwoke ga-aza aha m.” Ya mere, ọ gụrụ ogidi ahụ aha nke ya onwe ya. Ọ bụkwa Ogidi Absalọm ka a na-akpọ ya ruo taa.
2SA 18:19 Mgbe ahụ, Ahimaaz, nwa Zadọk, bịakwutere Joab sị ya, “Biko, ka m gbara ọsọ gaa zie eze oziọma a, na Onyenwe anyị azọpụtala ya site nʼaka ndị iro ya.”
2SA 18:20 Ma Joab zara sị ya, “Ọ bụghị gị ga-ezi eze ozi taa. I nwere ike ime ya mgbe ọzọ, ma ọ bụghị taa, nʼihi na nwa eze nwụrụ.”
2SA 18:21 Joab gwara otu nwoke onye Kush sị ya, “Gaa gwa eze ihe ị hụrụ.” Nwoke ahụ kpọrọ isiala, gbapụ ọsọ.
2SA 18:22 Ahimaaz nwa Zadọk rịọkwara Joab ọzọ sị ya, “Otu ọbụla o si dị, biko kwere ka m gbaso onye Kush a.” Ma Joab zara sị, “Nwa m nwoke, gịnị mere i ji chọọ ị ga? I nweghị ozi ọbụla ị ga-ezi nke ga-ewetara gị ụgwọ ọrụ.”
2SA 18:23 Ọ rịọrọ sị, “Otu ọbụla o si dị, hapụ m ka m gaa.” Nʼikpeazụ Joab kwenyere sị ya, “Ọ dị mma, gbara ọsọ gaa.” Ahimaaz sitere nʼụzọ dị mkpụmkpụ nke gafere obosara ala Jọdan buru nwoke Kush ahụ ụzọ gbaruo.
2SA 18:24 Devid nọ nʼọnụ ụzọ ama nʼoge a. Mgbe onye nche rigoruru nʼelu mgbidi ebe ọ na-anọ, ọ hụrụ otu nwoke ka ọ na-agba ọsọ naanị ya.
2SA 18:25 Onye nche ahụ kpọrọ Devid oku gwa ya na o nwere onye na-abịa. Ma eze zara ya sị, “Ọ bụrụ naanị ya, o nwere oziọma.” Mgbe onyeozi ahụ na-abịaru nso,
2SA 18:26 onye nche ahụ lepụkwara anya hụ otu nwoke ọzọ ka o ji ọsọ na-abịa naanị ya. Ọ kpọkwara oku ọzọ sị, “Onye ọzọ na-abịakwa.” Eze zara sị, “Onye ahụ ga-enwekwa oziọma.”
2SA 18:27 Onye nche ahụ zara sị, “Onye nke mbụ na-abịa dị ka Ahimaaz, nwa Zadọk,” Eze zara sị, “Ọ bụ ezi mmadụ, ọ bụkwa oziọma ka o ji na-abịa.”
2SA 18:28 Mgbe ahụ, Ahimaaz kpọrọ eze oku sị, “Udo!” Ọ kpọrọ isiala nye eze. Kpuokwa ihu ya nʼala sị, “Ngọzị na-adịrị Onyenwe anyị Chineke gị. Onye nke mebiri nzube ndị ahụ niile weliri aka imegide onyenwe m bụ eze.”
2SA 18:29 Eze jụrụ ya sị, “Oleekwanụ maka nwokorobịa ahụ bụ Absalọm? Ọ nọkwa nʼudo?” Ahimaaz zara sị, “Mgbe Joab zipụrụ ohu eze, na mụ onwe m, oke ụzụ dị, ma amaghị m ihe kpatara ya.”
2SA 18:30 Eze gwara ya sị, “Chere nʼebe a.” Ahimaaz chigharịrị chere.
2SA 18:31 Mgbe ahụ, onye Kush ahụ bịarutere sị, “Onyenwe m bụ eze, nụrụ oziọma a. Taa Onyenwe anyị ekpepụtala gị site nʼịnapụta gị nʼaka ndị niile biliri imegide gị.”
2SA 18:32 Eze jụrụ onye Kush ahụ, “Nwokorobịa ahụ bụ Absalọm, ọ nọkwa nʼudo?” Onye Kush ahụ zaghachiri, “Ka ndị iro onyenwe m bụ eze na ndị niile na-ebili imejọ gị dị ka nwokorobịa ahụ!”
2SA 18:33 Okwu a metụrụ eze nʼahụ nke ukwuu, o biliri rigoo nʼụlọ nke dị nʼọnụ ụzọ ama, nọdụ nʼebe ahụ kwaa akwa. Ọ nọ na-akwa akwa mgbe ọ na-aga, na-eti mkpu akwa na-asị, “O, nwa m, Absalọm! O nwa m, nwa m, Absalọm. A sịkwarị na m nwụrụ nʼọnọdụ gị! O, Absalọm nwa m, nwa m oo!”
2SA 19:1 Ọ dịghị anya ozi ruru Joab ntị sị, “Lee, eze na-akwa akwa, na-eru ụjụ nʼihi Absalọm.”
2SA 19:2 Mgbe ndị agha ya nụrụ na eze nọ nʼoke iru ụjụ nʼihi nwa ya, mmeri ha ghọọrọ ha ihu mgbarụ nʼụbọchị ahụ.
2SA 19:3 Ndị agha Devid niile zobatasịrị onwe ha nʼime obodo dịka a ga-asị na ha bụ ndị ihere na-eme dịka ndị e meriri nʼagha.
2SA 19:4 Eze kpuchiri ihu ya nọgidekwa na-akwa akwa na-asị, “O, nwa m Absalọm! O! Absalọm nwa m, nwa m!”
2SA 19:5 Emesịa, Joab jekwuuru eze nʼụlọ sị ya, “Anyị zọpụtara ndụ gị, na ndụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, na ndị nwunye gị, na ndị iko gị nwanyị taa, ma lee ka ị si emeso anyị. Ị na-eme ka ihere mee anyị, dịka a ga-asị na anyị mere ihe ọjọọ.
2SA 19:6 Ị hụrụ ndị iro gị nʼanya, ma na-akpọ ndị hụrụ gị nʼanya asị. I meela ya ka ọ pụta ìhè taa na o nweghị ihe ndị ọchịagha gị na ndị agha gị bụ nʼanya gị. Ahụrụ m na ọ gaara abụ ihe ziri ezi nʼanya gị ma a sịkwarị na Absalọm dị ndụ taa, ma anyị niile anwụọ.
2SA 19:7 Ugbu a, pụọ gaa kelee ndị agha gị. Eji m aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụrụ na ị pụghị nʼezi kelee ha, otu onye nʼime ha agaghị afọdụ nʼebe a mgbe chi taa jiri, mgbe ahụ ihe ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe niile i jirila anya gị hụ na ndụ gị.”
2SA 19:8 Ya mere, eze biliri nọdụ ọdụ nʼọnụ ụzọ ama. Mgbe ndị agha nụrụ na eze nọ nʼọnụ ụzọ ama, ha niile pụtara guzo nʼihu ya. Ma nʼoge a, ndị Izrel niile agbalaala, onye ọbụla nʼụlọ ya.
2SA 19:9 Nʼetiti ebo Izrel niile, ndị mmadụ nọ na-arụ ụka na-asị, “Eze napụtara anyị site nʼaka ndị iro anyị. Ọ bụ ya napụtara anyị site nʼaka ndị Filistia. Ma ugbu a, o sitela nʼala a gbapụ nʼihi Absalọm.”
2SA 19:10 Absalọm, onye anyị tere mmanụ ka ọ chịa anyị anwụọla nʼagha. Gịnị mere, unu a gaghị ekwu okwu i kpọghachite eze anyị?
2SA 19:11 Eze Devid zigaara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja ozi a, “Jụọnụ ndị okenye Juda sị, ‘Nʼihi gịnị ka unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ime ka eze lọghachi nʼobi ya, ebe ọ bụ na ihe a na-ekwu nʼala Izrel niile eruola eze ntị nʼebe o bi?
2SA 19:12 Ụmụnne m ka unu bụ, ọkpụkpụ m na anụ ahụ m. Gịnị mere unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ga-akpọlata eze nʼụlọ ya?’
2SA 19:13 Gwakwanụ Amasa sị ya, ‘Ọ bụ na ị bụghị ọkpụkpụ m na anụ ahụ m? Ka Chineke mesoo m mmeso otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na ị bụghị ọchịagha m malite taa nʼọnọdụ Joab.’ ”
2SA 19:14 Amasa mere ka obi ndị okenye Juda rulata, dịka otu mmadụ. Ha zigara eze ozi, sị, “Lọghachikwute anyị, gị na ndị ohu gị niile.”
2SA 19:15 Mgbe ahụ, eze lọghachitere na Jọdan. Ndị ikom Juda bịarutere Gilgal izute eze, na ịkpọfeta ya Jọdan.
2SA 19:16 Shimei, nwa Gera, onye Benjamin, nwoke ahụ sitere na Bahurim, mere ngwangwa soro ndị ikom Juda pụta izute eze Devid.
2SA 19:17 Ya na puku ndị ikom Benjamin sokwa. Ziba, onyeozi Sọl, na ụmụ ya ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ ndị ozi ya, mekwara ngwangwa ịbịarute Jọdan tupu eze erute nʼebe ahụ.
2SA 19:18 Ha gabigara mmiri nʼebe ọ dị nta ịkwọfe ndị ụlọeze nʼụgbọ mmiri, na ime ihe ọbụla dị mma nʼanya ya. Mgbe Shimei nwa Gera gafere Jọdan, ọ dara nʼala nʼihu eze,
2SA 19:19 sị ya, “Ka Onyenwe m, ghara ịgụkọrọ m njehie m nye m. Echetakwala otu ohu gị si mee ihe nʼezighị ezi nʼụbọchị onyenwe m hapụrụ Jerusalem pụọ. Ka eze ghara itinye ya nʼobi ya,
2SA 19:20 nʼihi na mụ bụ ohu gị maara na m mehiere, ma taa abịara m dịka onye mbụ site nʼagbụrụ Josef, ịbịa zute onyenwe m, bụ eze.”
2SA 19:21 Abishai nwa Zeruaya jụrụ eze sị ya, “Ọ bụ na Shimei agaghị anwụ nʼihi ihe a? Nʼihi nkọcha ọ kọchara onye Onyenwe anyị tere mmanụ bụ eze.”
2SA 19:22 Ma Devid sịrị, “Gịnị jikọtara mụ na unu ụmụ ndị ikom Zeruaya, nke mere na taa unu aghọọla ndị na-emegide m? O kwesiri ka e gbuo onye ọbụla nʼala Izrel taa? Ọ bụ na m amaghị na taa, abụ m eze Izrel?”
2SA 19:23 Ya mere eze gwara Shimei sị, “I gaghị anwụ. Eze jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa a.”
2SA 19:24 Mefiboshet, nwa nwa Sọl bịarukwara izute eze. Site nʼụbọchị eze hapụrụ Jerusalem, ọ sabeghị ụkwụ ya, ma uwe ya, ọ kpụghịkwa afụọnụ ya tutu ruo mgbe eze lọtara nʼudo.
2SA 19:25 Mgbe o si Jerusalem pụta izute eze, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Mefiboshet, gịnị mere i soghị m gaa?”
2SA 19:26 Ọ zara ya sị, “Onyenwe m, eze, agwara m Ziba ohu m ka o doziere m ịnyịnya ibu m, ka m soro eze, ma ebe m bụ onye ngwụrọ, ọ ghọgburu m.
2SA 19:27 O kwuluru ohu gị nʼebe onyenwe m bụ eze nọ. Ma onyenwe m bụ eze dịka mmụọ ozi Chineke, nʼihi ya mee m ihe masịrị gị.
2SA 19:28 Nʼagbanyeghị na ụlọ nna m niile dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe onyenwe m bụ eze nọ, ma i nyere ohu gị ọnọdụ nʼetiti ndị na-eri nri nʼelu tebul gị. Gịnị bụ ikike ọzọ m nwere iji rịọọ eze arịrịọ?”
2SA 19:29 Eze sịrị ya, “Nʼihi gịnị ka ị ka na-ekwuru okwu? Enyela m gị na Ziba iwu ka unu kee ala ahụ nʼetiti onwe unu.”
2SA 19:30 Mefiboshet sịrị eze, “Ka o were ihe niile ebe onyenwe m bụ eze lọghachiri nʼụlọ ya nʼudo.”
2SA 19:31 Bazilai onye Gilead sikwa na Rogelim bịa iso eze kwọfee osimiri Jọdan, na izilaga ya site nʼebe ahụ.
2SA 19:32 Nʼoge a, Bazilai bụ agadi nwoke, onye gbara iri afọ asatọ. Ọ lekọtara eze mgbe eze nọ na Mahanaim, nʼihi na ọ bụ ọgaranya.
2SA 19:33 Eze gwara Bazilai sị ya, “Soro m gafee osimiri ka i soro m biri na Jerusalem. Aga m elekọtakwa gị.”
2SA 19:34 Ma Bazilai zara eze sị ya, “Afọ ole ka ọ fọdụrụ m ịdị ndụ m ga-eji soro eze gaa Jerusalem?
2SA 19:35 Agbaala m iri afọ asatọ. Enwere m ike ịkọwa ihe dị iche nʼetiti ihe dị mma na nke na-adịghị mma. O nwere ụzọ ohu gị si anụ ụtọ ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O nwere ụzọ m si anụ olu ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ? Gịnị mere ohu gị ga-eji buru ibu arọ nye onyenwe m na eze?
2SA 19:36 Ohu gị ga-eso eze gafee osimiri Jọdan, maọbụ nʼihi gịnị ka eze ga-eji nye m onyinye ọzọ dị iche.
2SA 19:37 Biko, ka ohu gị laghachi, ka m nwee ike nwụọ nʼobodo m, nʼakụkụ ili nna m na nne m. Ma lee ohu gị bụ Kimham, ka o soro onyenwe m, bụ eze gafee. Gị mekwara ya ihe ọbụla dị mma nʼanya gị.”
2SA 19:38 Eze zara sị ya, “Ọ dị mma, Kimham ga-eso m gafee, aga m emekwara ya ihe ọma niile ị rịọrọ m.”
2SA 19:39 Ya mere, ndị ahụ niile gabigara Jọdan, mgbe ahụ eze gabigakwara. Eze suturu Bazilai ọnụ, gọziekwa ya, Bazilai laghachiri nʼụlọ ya.
2SA 19:40 Mgbe eze gabigara ruo Gilgal, Kimham sokwa ya gafee. Ndị agha Juda niile na otu ọkara ndị agha Izrel niile mere ka eze gabiga.
2SA 19:41 Ọ dịghị anya, ndị ikom Izrel niile nọ na-abịakwute eze na-asị ya, “Gịnị mere ụmụnna anyị, ndị ikom Juda, jiri zopu eze kpọfeta ya na ezinaụlọ na ndị ikom ya niile osimiri Jọdan?”
2SA 19:42 Ma ndị ikom Juda zara ndị ikom Izrel, “Anyị mere nke a nʼihi na eze bụ onye metụtara ahụ anyị. Gịnị mere iwe ji ewe unu maka nke a? Anyị eriela ihe ọbụla site na nri eze? Ka anyị anarala ihe ọbụla dobere onwe anyị?”
2SA 19:43 Ma ndị ikom Izrel zara sị, “Anyị dị ebo iri nʼIzrel, nʼihi ya, anyị nwere oke iri nʼime Devid karịa unu. Gịnị mere unu ji lelịa anyị anya? Chetakwanụ na ọ bụ anyị bu ụzọ kwuo okwu maka nlọta ya ịbụ eze anyị ọzọ.” Ma ndị ikom Juda ejighị olu ọma nye ndị Izrel ọsịsa.
2SA 20:1 Mgbe ahụ, otu onye okwu na ụka, aha ya bụ Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin nọ nʼebe ahụ nʼoge a. Ọ fụrụ opi ike ya tie mkpu sị, “Anyị enweghị oke nʼime Devid, anyị enwekwaghị ihe nketa nʼime nwa Jesi. Ndị Izrel, onye ọbụla laa nʼụlọ ikwu ya!”
2SA 20:2 Ya mere, ndị ikom Izrel niile tụgharịrị hapụ Devid, soro Sheba nwa Bikri. Ma ndị ikom Juda nọgidere soro eze ha site na Jọdan ruo Jerusalem.
2SA 20:3 Mgbe Devid lọghachitere nʼụlọ ya na Jerusalem. O nyere iwu ka ndị iko ya nwanyị iri ndị ahụ ọ hapụrụ ilekọta ụlọ, ndị ahụ ha na Absalọm dinara, nọrọ nʼụlọ dị iche, ebe a nọ na-eche ha nche. Eze abakwurughị ha ọzọ. Ha bụ ndị emechibidoro ụzọ, ha na-ebi ndụ dịka ndị di ha nwụrụ anwụ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ha.
2SA 20:4 Mgbe ahụ, eze gwara Amasa okwu sị, “Kpokọta ndị agha Juda ka ha bịakwute m nʼime abalị atọ. Gị onwe gị kwa ga-eso ha bịa nʼoge ahụ.”
2SA 20:5 Amasa pụrụ jee ịkpọkọta ndị Juda; ma o were ya ọtụtụ oge karịa abalị atọ.
2SA 20:6 Devid sịrị Abishai, “Lee nwoke a bụ Sheba nwa Bikri na-aga ime ihe ọjọọ ga-adị njọ karịa nke Absalọm mere. Chịrị ndị agha nna gị ukwu chụso ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-achọta obodo e wusiri ike gbaba, ebe anyị na-apụghị inweta ya.”
2SA 20:7 Ya mere ndị agha Joab, na ndị Keret na Pelet, na ndị niile bụ dike na dimkpa nʼagha pụrụ nʼikike ọchịchị Abishai. Ha si Jerusalem pụọ ịchụso Sheba nwa Bikri.
2SA 20:8 Mgbe ha rutere nʼoke nkume ahụ dị na Gibiọn, Amasa pụtara izute ha. Joab yi uwe agha ya nʼoge a; ọ fanyekwara mma agha ya nʼọbọ nʼukwu ya. Mgbe ọ gara nʼihu, mma ahụ si nʼọbọ ya dapụta.
2SA 20:9 Joab kelere Amasa sị ya, “Kedụ ka ị dị nwanna m.” Mgbe ahụ, Joab ji aka nri ya jide Amasa nʼahụọnụ isutu ya ọnụ,
2SA 20:10 Amasa elezighị anya hụ na mma agha nta dị nʼaka Joab. Joab mabanyere ya nʼime afọ Amasa, mee ka mgbịrị afọ ya sọsikwaa nʼala. Ọ maghị ya mma ahụ ugboro abụọ, nʼihi na otu ugboro ahụ mere ka Amasa nwụọ. Mgbe ahụ, Joab na nwanne ya Abishai chụsoro Sheba nwa Bikri nʼazụ.
2SA 20:11 Mgbe ahụ, otu nʼime ndị agha Joab guzo nʼakụkụ Amasa sị, “Onye ọbụla dịnyeere Joab na Devid ya bịa soro Joab nʼazụ.”
2SA 20:12 Ma Amasa tọgbọ nʼala nʼetiti ụzọ. Ọbara sikwa ya nʼahụ na-asọpụta. Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọtụtụ ndị agha na-agbakọ ile Amasa, o bupụrụ ozu ya nʼụzọ, were uwe kpuchie ya nʼọhịa.
2SA 20:13 Mgbe e bupụsịrị ozu Amasa nʼụzọ, ndị agha niile sooro Joab gaa ijide Sheba, nwa Bikri.
2SA 20:14 Sheba gabigara ebo niile nke Izrel ruo Ebel-Bet-Maaka, gabigakwa oke ala ndị Bikri, bụ ndị zukọtara soro ya.
2SA 20:15 Ndị agha Joab bịara gbochie ya na Ebel-Bet-Maaka. Ha wuru ihe mgbochi ruo obodo ahụ, nọbichie mgbidi dị ya gburugburu. Ebe ha nọ na-akụ mgbidi ahụ ihe, ka ha kwatuo ya.
2SA 20:16 Otu nwanyị maara ihe si nʼobodo ahụ kpọọ oku sị, “Geenụ m ntị, geenụ m ntị, gwanụ Joab ka ọ bịa nʼebe a. Achọrọ m ịgwa ya okwu.”
2SA 20:17 Joab pụtara gaa ya nso. Nwanyị ahụ jụrụ sị, “Ọ bụ gị bụ Joab?” Ọ zara sị, “E, ọ bụ m.” Mgbe ahụ, ọ gwara ya, “Gee ntị, ka i nụ ihe ohu gị nwere ikwu.” Joab sịrị ya, “Ana m ege ntị.”
2SA 20:18 Ọ gara nʼihu sị, “Nʼoge ochie a na-ekwu sị, ‘Gaa jụta ase nʼEbel,’ nʼụzọ dị otu a ka ha si ekwubi okwu.
2SA 20:19 Anyị bụ ndị udo na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼIzrel. I na-achọ ibibi obodo bụ nne nʼIzrel. Gịnị mere i ji chọọ iloda ihe nketa nke Onyenwe anyị?”
2SA 20:20 Joab zara sị, “Mba! Ọ bụghị uche m ịla obodo a nʼiyi.
2SA 20:21 Ọ bụghị otu a ka okwu ahụ dị. Otu nwoke a na-akpọ Sheba nwa Bikri, nke si nʼobodo ugwu Ifrem e weliela aka ya imegide eze, bụ Devid. Nyefee nwoke a ọsịịsọ nʼaka m, aga m esi nʼobodo a pụọ.” Nwanyị ahụ sịrị Joab, “A ga-atụpụtara gị isi ya site na mgbidi.”
2SA 20:22 Nwanyị ahụ ji ndụmọdụ nke amamihe ya gakwuru ndị obodo. Ha bipụrụ Sheba nwa Bikri isi, tụpụtara ya Joab. Ya mere na ọ fụrụ opi ike ya, ndị ikom ya sitere nʼobodo ahụ lasaa, onye ọbụla lara nʼụlọ nke ya. Joab laghachikwuru eze na Jerusalem.
2SA 20:23 Ọ bụ Joab ka e mere onyeisi agha na-achị ndị agha niile nke Izrel. Benaya nwa Jehoiada bụ onye na-achịkọta ndị Keret na ndị Pelet na-eche eze nche.
2SA 20:24 Adoniram na-ahụ maka ihe banyere ndị ọrụ mmanye. Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta ihe niile na-eme nʼobodo.
2SA 20:25 Sheva bụ ode akwụkwọ eze, Zadọk na Abịata bụ ndị nchụaja.
2SA 20:26 Ira, onye si nʼobodo Jaịa, bụ onye nchụaja eze Devid.
2SA 21:1 Ụnwụ dara afọ atọ nʼoge Devid na-achị, afọ kwa afọ. Devid chọrọ ihu Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Ọ bụ maka Sọl na ọbara ụlọ ya kwafuru, nʼihi na o gburu ndị Gibiọn.”
2SA 21:2 Eze kpọrọ ndị Gibiọn, gwa ha okwu. (Ndị Gibiọn abụghị ndị Izrel, kama ha bụ ndị fọdụrụ nʼime ndị Amọrait, ndị bi nʼala Kenan mgbe ụmụ Izrel batara. Mgbe ahụ ha batara, ndị Izrel ṅụrụ iyi nye ndị Gibiọn na ha agaghị egbu ha, ma Sọl sitere nʼịnụ ọkụ nke obi nʼihi Izrel na Juda chọọ ikpochapụ ha.)
2SA 21:3 Devid jụrụ ndị Gibiọn ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere unu? Gịnị ka m ga-eji kpuchie mmehie a e mere megide unu, ime ka unu gọzie ihe nketa Onyenwe anyị?”
2SA 21:4 Ndị Gibiọn zara ya sị, “Nsogbu anyị na Sọl na ndị ụlọ ya abụghị ihe a ga-eji ọlaọcha maọbụ ọlaedo mezie. Anyị achọkwaghị ka onye ọbụla nʼIzrel nwụọ nʼihi anyị.” Devid sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”
2SA 21:5 Ha zara eze sị, “Kwere ka anyị wezuga nwoke ahụ wetaara anyị mbibi na ịla nʼiyi, onye ahụ mere ka anyị ghara inwe ebe obibi ọbụla nʼala Izrel.
2SA 21:6 Ka akpọnye anyị ndị ikom asaa site nʼụmụ ya, ka anyị kwụgbuo ha nye Onyenwe anyị na Gibea Sọl, onye Onyenwe anyị họpụtara.” Eze zara sị, “Aga m akpọnye unu ha.”
2SA 21:7 Ma eze nwere ọmịiko nʼahụ Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, nʼihi ịgba ndụ dị nʼetiti ya na Jonatan nʼihu Onyenwe anyị.
2SA 21:8 Ma eze kpọọrọ Amoni na Mefiboshet, ụmụ ndị ikom abụọ nke Rizpa, nwa nwanyị Aịa, bụ ndị ọ mụtaara Sọl. Nakwa ụmụ ndị ikom ise nke Merab nwa Sọl mụtara mgbe ọ bụ nwunye Adriel, nwa Bazilai onye Mehola.
2SA 21:9 O nyefere ha niile nʼaka ndị Gibiọn; ndị Gibiọn kwụbakwara ha nʼugwu nʼihu Onyenwe anyị. Ha asaa nwụrụ nʼotu ụbọchị na mmalite owuwe ihe ubi nke ọka balị.
2SA 21:10 Ma Rizpa, nwa nwanyị Aịa were akwa mkpe gbasara onwe ya nʼelu nkume. O kweghịkwa ka anụ ufe bekwasị ha nʼehihie, maọbụ anụ ọhịa nʼabalị. Ọ nọgidere nʼebe ahụ site nʼoge mmalite owuwe ihe ubi tutu ruo mgbe mmiri bidoro izokwasị anụ ahụ ha.
2SA 21:11 Mgbe a gwara Devid ihe Rizpa, nwa nwanyị Aịa, iko nwanyị Sọl mere,
2SA 21:12 ọ gara chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya Jonatan site nʼaka ndị nwe obodo Jebesh Gilead. Ha gara na nzuzo zuru ozu Sọl na Jonatan site nʼama dị na Bet-Shan, ebe ndị Filistia kwụbara ha, oge ha gburu Sọl na Gilboa.
2SA 21:13 Devid sitere nʼebe ahụ chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan, chịkọtaakwa ọkpụkpụ ndị ahụ akwụgburu.
2SA 21:14 Ha liri ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan nʼobodo Zela nʼala Benjamin, nʼime ili Kish nna Sọl, meekwa ihe ndị ọzọ niile eze nyere nʼiwu. Mgbe nke a gasịrị, Chineke zara ekpere nʼihi ala ahụ.
2SA 21:15 Emesịa, ndị Filistia busokwara Izrel agha ọzọ. Devid na ndị agha ya pụkwara ịlụso ha ọgụ. Nʼoge ha na-alụ ọgụ a, ike gwụrụ Devid nke ukwuu.
2SA 21:16 Mgbe ahụ, Ishibi-Benob, otu onye agbụrụ Rafa, onye ịdị arọ nke bronz dị nʼọnụ ùbe ya ruru kilogram atọ na ọkara, onye jikwa mma agha ọhụrụ, bịaruru Devid nso chọọ igbu ya.
2SA 21:17 Ma Abishai nwa Zeruaya bịara nyere Devid aka, tigbuo onye Filistia ahụ. Site nʼoge ahụ, ndị ikom Devid ṅụrụ iyi sị ya, “Ị gaghị esokwa anyị gaa ibu agha ọzọ! Ka a ghara imenyụ oriọna Izrel.”
2SA 21:18 Mgbe oge gaturu, ha na ndị Filistia lụrụ agha ọzọ na Gob. Nʼoge a, Sibekai, onye Husha, gburu Saf, otu nʼime ndị agbụrụ Rafa.
2SA 21:19 Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ na Gob, Elhanan nwa Jaịa onye Betlehem gburu nwanne Golaịat onye Gat, onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa.
2SA 21:20 Nʼagha ọzọkwa, bụ nke a lụrụ na Gat, e nwere otu nwoke gbara oke dimkpa, nke nwere mkpịsịaka isii nʼaka ya ọbụla, nweekwa mkpịsịụkwụ isii nʼụkwụ ya ọbụla, ya bụ, a gụkọtaa ha niile, iri mkpịsịaka na mkpịsịụkwụ abụọ na anọ. Ọ bụkwa onye amụrụ nʼagbụrụ Rafa.
2SA 21:21 Mgbe ọ kọchara Izrel, Jonatan nwa Shimei, nwanne nwoke Devid, gburu ya.
2SA 21:22 Mmadụ anọ ndị a bụ ndị agbụrụ Rafa dị na Gat. Devid na ndị agha ya gburu ha niile.
2SA 22:1 Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl.
2SA 22:2 Ọ sịrị: “Onyenwe anyị bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.
2SA 22:3 Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m. Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m, site nʼaka ndị na-eme ihe ike.
2SA 22:4 “Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto. Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
2SA 22:5 Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu; Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.
2SA 22:6 Ụdọ niile nke ili kere m agbụ, Ọnya nke ọnwụ guzogidere m.
2SA 22:7 “Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị, akpọkuru m Chineke m. Akwa m ruru ya ntị. O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
2SA 22:8 Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji, ntọala eluigwe makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.
2SA 22:9 Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta; Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta. Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.
2SA 22:10 O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
2SA 22:11 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, O feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
2SA 22:12 O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.
2SA 22:13 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, amụma egbe eluigwe nwupụtara ire ọkụ.
2SA 22:14 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ. Olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
2SA 22:15 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa. O jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.
2SA 22:16 E kpughere ala ala nke oke osimiri. Gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, site nʼịba mba nke Onyenwe anyị, na nkuume si nʼimi ya pụta.
2SA 22:17 “O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
2SA 22:18 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.
2SA 22:19 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m. Ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.
2SA 22:20 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, Ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.
2SA 22:21 “Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị, Ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.
2SA 22:22 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị; ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.
2SA 22:23 Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.
2SA 22:24 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.
2SA 22:25 Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, dịka ịdị ọcha m si dị nʼanya ya.
2SA 22:26 “Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.
2SA 22:27 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, Ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.
2SA 22:28 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala.
2SA 22:29 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m, Onyenwe anyị na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
2SA 22:30 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ; sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.
2SA 22:31 “Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke; okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha. Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
2SA 22:32 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke?
2SA 22:33 Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.
2SA 22:34 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
2SA 22:35 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.
2SA 22:36 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.
2SA 22:37 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ. Ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.
2SA 22:38 “Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha. Alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.
2SA 22:39 Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite. Ha dara nʼokpuru ụkwụ m abụọ.
2SA 22:40 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha. I wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.
2SA 22:41 I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga. Ebibiekwala m ha niile.
2SA 22:42 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.
2SA 22:43 Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala. Asụrụ m ha akwụ, zọtọọ ha dịka apịtị nke okporoụzọ.
2SA 22:44 “Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ. Ị chebere m dịka onyeisi nke ọtụtụ mba. Ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.
2SA 22:45 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.
2SA 22:46 Obi na-ada ha mba. Ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.
2SA 22:47 “Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m. Mbuli elu dịrị Chineke m, bụ oke nkume ahụ, Onye nzọpụta m.
2SA 22:48 Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ. Onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m.
2SA 22:49 Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro m. Napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.
2SA 22:50 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche. Aga m abụku aha gị abụ otuto.
2SA 22:51 “Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu. Ọ na-egosikwa onye ya o tere mmanụ obi ebere. Ihe ndị a ka ọ na-emere Devid na ụmụ ụmụ ya, ruo mgbe niile ebighị ebi.”
2SA 23:1 Ndị a bụ okwu ikpeazụ Devid kwuru: “Okwu pụrụ iche si nʼọnụ Devid, nwa Jesi, ihe si nʼọnụ nwoke ahụ Chineke Onye kachasị ihe niile elu buliri elu. Nwoke ahụ onye Chineke nke Jekọb tere mmanụ, onye bụ ọka nʼịbụ abụ nʼala Izrel.
2SA 23:2 “Mmụọ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ m, okwu ya dịkwa m nʼire.
2SA 23:3 Chineke Izrel kwuru okwu, Oke nkume Izrel sịrị m, ‘Mgbe mmadụ na-achị ndị ọzọ site nʼezi omume, mgbe ọ na-achị site nʼegwu Chineke.
2SA 23:4 Ọ dị ka ìhè nke ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-achawapụta nʼụtụtụ nke igwe ojii na-adịghị. Dịka ìhè na-acha mgbe mmiri zochara nke na-eme ka ahịhịa ndụ na-epupụta nʼala.’
2SA 23:5 “Ọ bụrụ na ihe banyere ụlọ m ezighị ezi nʼebe Chineke nọ. Nʼezie, ọ garaghị ekwe ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ya, Ọgbụgba ndụ e doro nʼusoro nke e mere ka o guzosie ike nʼụzọ niile. Nʼezie, ọ garaghị eme ka nzọpụta m zuo oke. Ma mezukwaara m ọchịchọ obi m niile.
2SA 23:6 Ma ndị ajọ mmadụ ka a ga-atụfu nʼakụkụ dịka ogwu, nke mmadụ anaghị eji aka ekpokọta.
2SA 23:7 Onye ọbụla metụrụ ogwu aka, bụ onye nwere ngwa ọrụ igwe maọbụ osisi ùbe. A na-esure ha ọkụ nʼebe ha tọgbọrọ.”
2SA 23:8 Ndị a bụ aha ndị dike nʼagha Devid nwere: Josheb-Bashebet, onye Takemon, bụ onyeisi nke mmadụ atọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom asatọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha.
2SA 23:9 Onye nke na-eso ya bụ Elieza, nwa Dodayi, onye Ahohi. Dịka otu nʼime ndị dike atọ ahụ, ya na Devid nọ mgbe ha na-akwa ndị Filistia emo, bụ ndị zukọrọ na Pas Damim ibu agha. Mgbe ahụ, ndị Izrel lara azụ,
2SA 23:10 ma Elieza guzoro na-alaghị azụ. O gbugidere ndị Filistia ruo mgbe ike gwuru aka ya. Aka ya rapakwaara na mma agha. Onyenwe anyị nyekwara ha mmeri dị ukwuu nʼụbọchị ahụ. Ndị agha ahụ laghachikwutere Elieza, maọbụ naanị ka ha yipụsịa ndị ahụ e gburu egbu ihe ha yi nʼahụ.
2SA 23:11 Onye nke atọ bụ Shama, nwa Agee, onye Hara. Mgbe ndị Filistia chịkọtara onwe ha nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara na lentil, ma ndị agha Izrel niile sitere nʼebe ha nọ gbapụ.
2SA 23:12 Ma naanị Shama guzoro nʼetiti ubi lentil ahụ. Ọ napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu.
2SA 23:13 Nʼoge owuwe ihe ubi, mmadụ atọ nʼime iri ndị dike atọ ahụ, jekwuru Devid nʼọgba nkume Adulam, mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim.
2SA 23:14 Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha Filistia dị na Betlehem.
2SA 23:15 Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu. Ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ, site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!”
2SA 23:16 Ya mere, ndị dike nʼagha atọ ahụ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị.
2SA 23:17 Ọ sịrị, “Ya bụrụ m ihe arụ, Onyenwe anyị, na m ga-eme nke a. Nke a ọ bụghị ọbara ndị ikom a, ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Devid ekweghị aṅụ ya. Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara.
2SA 23:18 Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a.
2SA 23:19 Ma anaghị asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa iri ndị ikom atọ ahụ? Ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie a na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.
2SA 23:20 Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha nke kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya.
2SA 23:21 O tigburu otu nwoke onye Ijipt, gbara dimkpa. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe nʼaka ya, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya. Pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị nʼaka ya. Jiri ya magbuo ya
2SA 23:22 Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ mbụ.
2SA 23:23 A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche.
2SA 23:24 Nʼetiti iri ndị ikom atọ ahụ bụ: Asahel, nwanne Joab, Elhanan nwa Dodo, onye Betlehem
2SA 23:25 Shama, onye Harod, Elika, onye Harod,
2SA 23:26 Helez onye Palti, Ira, nwa Ikesh, onye Tekoa,
2SA 23:27 Abieza, onye Anatot, Mebunai, onye Husha,
2SA 23:28 Zalmon, onye Ahohi, Maharai, onye Netofa,
2SA 23:29 Heled, nwa Baana, onye Netofa, Itai, nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin,
2SA 23:30 Benaya, onye Piraton, Hidaị, nke si nʼakụkụ iyi dị na Gaash,
2SA 23:31 Abi-Albon, onye Arba, Azmavet, onye Bahurim
2SA 23:32 Eliaba, onye Shaalbon, Ụmụ Jashen, Jonatan
2SA 23:33 nwa Shama, onye Hara Ahiam, nwa Shara nke Hara,
2SA 23:34 Elifelet, nwa Ahasbaị, onye Maaka, Eliam, nwa Ahitofel, onye Gailo,
2SA 23:35 Hezro, onye Kamel, Paraị, onye Aaba,
2SA 23:36 Igal nwa Netan, onye Zoba, nwa Hagri,
2SA 23:37 Zelek, onye Amọn, Naharai, onye Beerọt, onye na-ebu ihe agha Joab nwa Zeruaya,
2SA 23:38 Ira, onye Itra, Gareb, onye Itra
2SA 23:39 na Ụraya, onye Het. Ha niile dị iri ndị ikom atọ na asaa.
2SA 24:1 Ọzọkwa, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Izrel. Ọ kpaliri Devid imegide ha, sị, “Gaa gụọ Izrel na Juda ọnụ.”
2SA 24:2 Ya mere, eze gwara Joab na ndịisi ọchịagha ya ha so, “Jegharịa nʼebo niile nke Izrel, site na Dan ruo Bịasheba, gụkọtaa ndị tozuru ije agha nʼIzrel niile ka m nwee ike mata ole ọnụọgụgụ ha dị.”
2SA 24:3 Joab zaghachiri eze, “Ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị, mee ka ndị agha mụbaa, otu onye narị ụzọ, otu onye narị ụzọ karịa. Ka anya onyenwe m, bụ eze, hụkwa ya. Ma nʼihi gịnị ka onyenwe m bụ eze ji chọọ ime ihe dị otu a?”
2SA 24:4 Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab na nke ndị ọchịagha ahụ. Ya mere, ha hapụrụ ihu eze pụọ ịgụ ndị agha Izrel ọnụ.
2SA 24:5 Mgbe ha gabigachara Jọdan, ha manyere ụlọ ikwu ha na nso Aroea, nʼaka nri obodo ahụ dị nʼetiti ndagwurugwu Gad na-eru Jeza,
2SA 24:6 ha gara Gilead ruokwa nʼala Taatim Hodshi, bịarukwaa Dan Jaan, jee gburugburu jeruo Saịdọn.
2SA 24:7 Ha jere ruokwa nʼebe e wusiri ike nke Taịa, na obodo niile nke ndị Hiv, na nke ndị Kenan. Nʼikpeazụ, ha gaara ruo Bịasheba nʼime ndịda Juda.
2SA 24:8 Mgbe ha jegharịchara nʼala ahụ niile; ha lọghachitere na Jerusalem na ngwụcha ọnwa nke itoolu na iri abalị abụọ ya.
2SA 24:9 Joab nyere eze ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel. NʼIzrel, ha dị narị puku asatọ, bụ ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, na Juda ha dị narị puku ise.
2SA 24:10 Ma obi Devid bidoro ịta ya ụta mgbe ọ gụchara ndị ikom na-alụ agha ọnụ. Ọ sịrị Onyenwe anyị, “Emehiela m nke ukwuu nʼihi ihe m mere. Ma ugbu a, Onyenwe anyị biko, arịọ m gị, wezuga ikpe ọmụma nke dịịrị ohu gị; nʼihi na emeela m ihe nzuzu dị ukwuu.”
2SA 24:11 Nʼụtụtụ echi ya, tupu Devid na-eteta nʼụra, okwu Onyenwe anyị eruola Gad onye amụma, bụ onye ọhụ ụzọ Devid, sị,
2SA 24:12 “Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’ ”
2SA 24:13 Ya mere, Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ọ bụ ka oke ụnwụ ịda nʼala gị afọ atọ? Ka ọ bụ na ị ga-agbalaga site nʼihu ndị iro gị ọnwa atọ, ka ha na-achụ gị ọsọ? Ka ọ bụ ka ajọ ọrịa na-efe efe daa nʼala gị mkpụrụ ụbọchị atọ? Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.”
2SA 24:14 Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu, ọ ka mma ka anyị daba nʼaka Onyenwe anyị karịa ịdaba nʼaka mmadụ, nʼihi na obi ebere ya bara ụba.”
2SA 24:15 Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ajọ ọrịa na-efe efe nʼala Izrel, site nʼụtụtụ ahụ ruo oge akara aka. Ọ bụ iri puku mmadụ asaa nwụrụ site na Dan ruo Bịasheba.
2SA 24:16 Mgbe mmụọ ozi ahụ setịpụrụ aka ya ibibi Jerusalem, o wutere Onyenwe anyị nʼihi oke mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-eweta nhụju anya nye ndị mmadụ, “O zuola. Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị nọ nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus.
2SA 24:17 Mgbe Devid hụrụ mmụọ ozi ahụ na-etida ndị mmadụ, ọ sịrị Onyenwe anyị, “Ọ bụ mụ onwe m mehiere; mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mere ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? Ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.”
2SA 24:18 Nʼụbọchị ahụ, Gad bịara nʼụlọ Devid gwa ya sị, “Gaa, wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus.”
2SA 24:19 Ya mere, Devid rubere isi gaa mee dịka iwu Onyenwe anyị nyere site nʼọnụ Gad.
2SA 24:20 Mgbe Arauna weliri anya hụ eze na ndị ọrụ ya ka ha na-abịa nʼebe ọ nọ, ọ pụtara kpọọ isiala nye eze. Kpudokwa ihu ya nʼala.
2SA 24:21 Arauna sịrị, “Gịnị mere onyenwe m, bụ eze ji bịakwute ohu ya?” Devid zaghachiri, “Abịara m ịzụrụ ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja; ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ.”
2SA 24:22 Arauna sịrị Devid, “Ka onyenwe m, bụ eze were ihe ọbụla ọ chọrọ, werekwa chụọ aja. Lee ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, leekwa ihe igwe ịzọcha ọka niile, na osisi ndị ahụ niile a na-anyanye ehi nʼolu, ka ha bụrụ nkụ.
2SA 24:23 Eze, ihe ndị a niile ka mụ bụ Arauna na-enye eze, ka Onyenwe anyị Chineke gị nabatakwa gị.”
2SA 24:24 Ma eze zaghachiri Arauna, “Ee, aghaghị m ịkwụzu gị ụgwụ ya, nʼihi na agaghị m achụrụ Onyenwe anyị, bụ Chineke m aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.” Ya mere, Devid zụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ na ehi ahụ niile, kwụọ Arauna iri shekel ọlaọcha ise, nʼihi ha.
2SA 24:25 Devid wuru ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ. Chụọkwa aja nsure ọkụ na aja udo. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara ekpere o kpere nʼihi ala ahụ. Nrịa nrịa ahụ na-efe efe nke dakwasịrị Izrel kwụsịkwara.
1KI 1:1 Mgbe eze Devid ghọrọ agadi, nʼagbanyeghị na-eji ọtụtụ uwe kpuchie ya, ahụ ya ekpoghị ọkụ.
1KI 1:2 Ya mere, ndị na-ejere ya ozi sịrị ya, “Ka anyị chọtara eze otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, onye ga-akwụ nʼihu eze ma bụrụkwa onye ga-elekọta ya. O nwere ike idina nʼakụkụ onyenwe anyị bụ eze ime ka ahụ kpoo ya ọkụ.”
1KI 1:3 Ha gagharịrị nʼala Izrel niile chọọ nwaagbọghọ mara mma, chọta otu nwaagbọghọ onye Shunem, aha ya bụ Abishag, kpọtaara ya eze.
1KI 1:4 Nwaagbọghọ a mara mma nke ukwuu; ọ lekọtakwara eze, jekwaara ya ozi ma ya na eze enweghị mmekọ ọbụla.
1KI 1:5 Nʼoge a, Adonaịja onye nne ya bụ Hagit, wepụtara onwe ya, kwuo sị, “Aga m abụ eze.” Nʼihi nke a, ọ kwadooro onwe ya ụgbọ agha na ọtụtụ ịnyịnya, kpọtakwa iri ndị ikom ise, ndị ga-agba ọsọ nʼihu ya.
1KI 1:6 Na ndụ Adonaịja niile, o nweghị oge nna ya baara ya mba site nʼịjụ ya, “Gịnị mere i ji akpa agwa dị otu a?” Ọ bụ nwokorobịa mara mma nke ukwuu; ọ bụ ya na-esotekwa nwanne ya Absalọm.
1KI 1:7 Adonaịja na Joab, nwa Zeruaya tinyere Abịata onye nchụaja, kparịtara ụka. Ha kwenyere inyere ya aka ka ọ ghọọ eze.
1KI 1:8 Ma Zadọk onye nchụaja, Benaya nwa Jehoiada, Netan onye amụma, Shimei, Rei na ndị agha niile na-eche Devid nche esonyeghị Adonaịja.
1KI 1:9 Adonaịja chịịrị atụrụ, ehi na ụmụ ehi gbara abụba, gaa nʼakụkụ En-Rogel chụọ aja na Nkume Zohelet. Ọ kpọrọ ụmụnne ya niile bụ ụmụ ndị ikom eze na ndịisi Juda niile, ndị na-ejere eze ozi oku,
1KI 1:10 ma ọ kpọghị Netan onye amụma, maọbụ Benaya, maọbụ ndị agha niile na-eche Devid nche. Ọ kpọkwaghị Solomọn nwanne ya.
1KI 1:11 Mgbe ahụ, Netan onye amụma jụrụ Batsheba nne Solomọn ajụjụ sị, “Ị nụghị na Adonaịja nwa Hagit aghọọla eze ugbu a, ma onyenwe anyị bụ Devid amaghị ihe ọbụla banyere ya?
1KI 1:12 Ma ugbu a, ka m dụọ gị ọdụ otu ị ga-esi zọpụta ndụ gị na ndụ nwa gị Solomọn.
1KI 1:13 Bakwuru eze Devid sị ya, ‘Onyenwe m bụ eze, ọ bụ na i kweghị m bụ ohu gị nkwa sị: “Nʼezie, Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ ga-anọdụ nʼocheeze m”? Ma gịnị mere Adonaịja ji bụrụ eze?’
1KI 1:14 Mgbe ị ka nọ na-akpanyere eze ụka, mụ onwe m ga-abịakwute gị gbaa okwu niile ị na-ekwu ume.”
1KI 1:15 Batsheba bakwuuru eze nʼime ụlọ. Eze emeela nnọọ agadi nke ukwuu. Abishag onye Shunem nọkwa na-elekọta ya.
1KI 1:16 Batsheba gburu ikpere nʼala, kpọọ isiala nye eze. Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị na-achọ?”
1KI 1:17 Batsheba zara sị ya, “Onyenwe m, i jiri Onyenwe anyị Chineke gị ṅụọrọ m iyi, kwee m nkwa sị na nwa m Solomọn ga-abụ eze, nọdụkwa nʼocheeze gị.
1KI 1:18 Ma ugbu a, Adonaịja aghọọla eze, ma gị onyenwe m bụ eze amaghị ihe banyere nke a.
1KI 1:19 O jirila ọtụtụ igwe ehi na ụmụ ehi gbara abụba, na atụrụ chụọ aja. Ọ kpọkwara ụmụ ndị ikom eze niile na Abịata onye nchụaja, na Joab onyeisi agha. Ma ọ kpọghị Solomọn bụ ohu gị.
1KI 1:20 Ma ugbu a, onyenwe m eze, ndị Izrel niile na-ele gị anya isi nʼọnụ gị nụta onye ga-anọchi anya gị, ịnọkwasị nʼocheeze eze gị.
1KI 1:21 Ma ọ bụghị otu a, ngwangwa onyenwe m bụ eze ga-esoro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, mụ onwe m na nwa m Solomọn ka a ga-emeso mmeso dịka ndị mmebi iwu.”
1KI 1:22 Mgbe Batsheba nọ na-akpanyere eze ụka, Netan onye amụma batara.
1KI 1:23 A gwara eze okwu sị, “Netan onye amụma nọ nʼebe a.” Ya mere, ọ gara nʼihu eze kpọọ isiala nye ya.
1KI 1:24 Netan sịrị, “Onyenwe m, bụ eze, ọ bụ gị onwe gị sịrị Adonaịja ga-abụ eze mgbe ị nwụrụ, na ọ ga-anọkwasịkwa nʼocheeze gị?
1KI 1:25 Taa, ọ gaala jiri ọtụtụ igwe ehi, na ụmụ ehi gbara abụba, na ụmụ atụrụ chụọ aja. Ọ kpọọkwala ụmụ ndị ikom eze niile. Ọ kpọkwara ndịisi agha, na Abịata onye nchụaja. Ha na ya na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-eti mkpu na-asị, ‘Eze Adonaịja ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.’
1KI 1:26 Ma ha akpọghị mụ bụ ohu gị na Zadọk, onye nchụaja, na Benaya nwa Jehoiada, na ohu gị bụ Solomọn.
1KI 1:27 Ọ bụ site nʼaka onyenwe m bụ eze ka ihe nke a siri mee, ma i meghị ka ndị ohu ya mata onye ga-anọdụ nʼocheeze onyenwe m eze, mgbe ọ nọghịkwa ya?”
1KI 1:28 Mgbe ahụ, Devid kwuru okwu sị, “Kpọọrọnụ m Batsheba.” Batsheba batara, guzo nʼihu eze.
1KI 1:29 Mgbe ahụ, eze ṅụrụ iyi sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, Onye ahụ napụtara m site na nsogbu m niile,
1KI 1:30 otu ahụ m siri ṅụrụ gị iyi nʼaha Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sị, na Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ bụ ya ga-anọchi anya m, nọdụkwa nʼocheeze m. Otu ahụ ka m ga-eme nʼụbọchị taa.”
1KI 1:31 Mgbe ahụ, Batsheba kpọrọ isiala, gbukwaa ikpere nʼihu eze sị ya, “Ka onyenwe m eze Devid dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
1KI 1:32 Mgbe ahụ, Devid nyere iwu sị, “Kpọọrọ m Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya, nwa Jehoiada.” Mgbe ha niile bịara nʼihu eze,
1KI 1:33 ọ sịrị ha, “Duru ndị ozi onyenwe unu, tinyere unu onwe unu, mee ka Solomọn nwa m nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul nke mụ onwe m, kpọrọnụ ya gbada Gaihọn.
1KI 1:34 Nʼebe ahụ, ka Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, tee ya mmanụ ịbụ eze Izrel. Fụkwaanụ opi, tiekwanụ mkpu sị, ‘Eze Solomọn ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.’
1KI 1:35 Mgbe ahụ, unu na ya ga-esokwa gbagota, ọ ga-abịa nọkwasị nʼocheeze m ịchị nʼọnọdụ m. Nʼihi na ọ bụ ya ka m họpụtara ịchị eze nʼIzrel na Juda.”
1KI 1:36 Benaya nwa Jehoiada zara eze sị, “Amen, ka Onyenwe anyị Chineke onyenwe m na eze, kwupụta ya ka ọ dị otu a.
1KI 1:37 Dịka Onyenwe anyị si nọnyere onyenwe m bụ eze, biko, ka o si otu a nọnyere Solomọn ime ka ocheeze ya dị ukwuu karịa ocheeze onyenwe m bụ eze Devid.”
1KI 1:38 Ya mere, Zadọk, onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya, nwa Jehoiada, na ndị Keret na ndị Pelet, duuru Solomọn mee ya ka ọ nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul nke eze Devid. Emesịa, ha duuru ya gaa Gaihọn.
1KI 1:39 Nʼebe ahụ, Zadọk onye nchụaja wepụtara mpi mmanụ ahụ dị nʼụlọ nzute Chineke, were tee Solomọn nʼisi. Ha fụkwara opi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze Solomọn dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
1KI 1:40 Ndị Izrel niile sooro ya rigoo, na-afụ ọja na-aṅụrịkwa oke ọnụ, ruo nʼala mara jijiji nʼihi oke ụzụ.
1KI 1:41 Adonaịja na ndị ọbịa ya niile nụrụ mkpu ọṅụ ahụ mgbe ha onwe ha na-erisi nri. Mgbe Joab nụrụ opi ike ka ọ na-ada, ọ jụrụ sị, “Gịnị mere oke ụzụ dị otu a ji na-ada nʼime obodo.”
1KI 1:42 Ma mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, lee Jonatan nwa Abịata onye nchụaja, ka ọ batara. Adonaịja sịrị, “Bata! Nʼihi na ị bụ ezi mmadụ amaara m na ọ bụ oziọma ka i ji bịa.”
1KI 1:43 Jonatan zara ya sị, “Mba, ọ dịghị otu ahụ! Onyenwe anyị eze Devid emeela Solomọn eze.
1KI 1:44 Eze e zigala ya na Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya nwa Jehoiada, ndị Keret na ndị Pelet sokwa duru ya gaa. Ha mere ka ọ nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul eze.
1KI 1:45 Zadọk onye nchụaja na Netan onye amụma eteela ya mmanụ na Gaihọn ịbụ eze. Ha esitekwala nʼebe ahụ ṅụrụ ọṅụ na-alaghachikwa, ndị obodo niile nọkwa ugbu a na-eme mkpọtụ, na-aṅụrịkwa ọṅụ. Ọ bụkwa ụzụ ọṅụ ha ka unu nụrụ.
1KI 1:46 Solomọn na-anọkwasị nʼocheeze ugbu a.
1KI 1:47 Ọzọkwa, ndị na-ejere eze ozi abịala ikele onyenwe anyị eze Devid ekele, na-asị, ‘ka Chineke gị mee ka aha Solomọn bụrụ aha a ma ama karịa nke gị, ka ocheeze Solomọn dịkwa ukwuu karịa nke gị.’ Eze nọkwa nʼelu ihe ndina ya kpọọ isiala ofufe,
1KI 1:48 sị, ‘Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke Izrel onye mere ka m jiri anya m hụ onye nọchiri anya nʼocheeze m taa.’ ”
1KI 1:49 Mgbe ahụ, Adonaịja, na ndị ọbịa ya si nʼebe ha na-eri ihe malie. Onye ọbụla sikwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ, nʼihi ụjọ.
1KI 1:50 Ma Adonaịja tụrụ egwu nke ukwuu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya, ọ gara jide mpi dị nʼebe ịchụ aja aka.
1KI 1:51 Mgbe ahụ, a gwara Solomọn sị, “Adonaịja na-atụ egwu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya ọ na-ejide mpi ebe nchụaja aka. Ọ na-asị, ‘Ka eze Solomọn ṅụọra m iyi taa sị na ọ gaghị eji mma agha gbuo ohu ya.’ ”
1KI 1:52 Solomọn zara sị, “Ọ bụrụ na o gosi onwe ya dịka onye kwesiri ntụkwasị obi, otu agịrị isi dị ya nʼisi agaghị ada nʼala, ma ọ bụrụ na a hụta ihe ọjọọ na nʼaka ya, ọ ga-anwụ.”
1KI 1:53 Mgbe ahụ, eze Solomọn, zigara ndị ozi mere ka o site nʼebe nchụaja rịdata. Adonaịja bịara kpọọ isiala nye eze Solomọn. Mgbe ahụ, Solomọn sịrị ya, “Laa nʼụlọ gị.”
1KI 2:1 Mgbe ụbọchị ọnwụ eze Devid na-abịaru nso, o nyere nwa ya Solomọn iwu sị ya,
1KI 2:2 “Oge ọnwụ m eruola,” ka ọ sịrị, “Ya mere, dị ike, meekwa dịka nwoke.
1KI 2:3 Debe iwu niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị nyere, bie ndụ nʼụzọ ya niile. Debekwa ụkpụrụ na ihe niile o nyere nʼiwu, na ntụziaka ya niile dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mee nke a ka ihe niile ị ga-eme gaara gị nke ọma, nʼihe niile ị na-eme, nʼebe ọbụla ị na-eche ihu gị.
1KI 2:4 Ka Onyenwe anyị mezuo nkwa o kwere banyere m, sị ‘Ọ bụrụ na ụmụ gị na ụmụ ụmụ ha elezie anya nʼotu ha si ebi ndụ, ọ bụrụ na ha ejegharịa nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi nʼihu m, jiri obi ha niile na mkpụrụobi ha mee nke a, ị gaghị achọ onye ga-anọkwasị nʼoche eze Izrel achọ.’
1KI 2:5 “Ugbu a, gị onwe gị maara ihe Joab nwa Zeruaya mere m, ya bụ ihe o mere mmadụ abụọ bụ ndịisi agha Izrel, Abna nwa Nea, na Amasa nwa Jeta. O gburu ha, wufuo ọbara ha nʼoge udo, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe e mere nʼagha. O jikwa ọbara ahụ merụọ ihe okike o kere nʼukwu na akpụkpọụkwụ o yi nʼụkwụ.
1KI 2:6 Ị bụ nwoke maara ihe, ị makwaara ihe ị ga-eme. Ekwela ka Joab, nʼagbanyeghị isi awọ ya, nwụọ nʼudo.
1KI 2:7 “Ma meere ụmụ Bazilai onye Gilead ebere. Meekwa ka ha bụrụ ndị na-eso gị rie ihe na tebul gị nʼihi na ha ji obi ha zute m mgbe m na-agba ọsọ ndụ nʼihi nwanne gị Absalọm.
1KI 2:8 “Cheta Shimei, nwa Gera, onye Benjamin ahụ bi nʼobodo Bahurim, onye kọchara m nkọcha jọgburu onwe ya nʼụbọchị ahụ m jere Mahanaim. Mgbe ọ bịara izute m na Jọdan, eji m aha Onyenwe anyị ṅụọrọ ya iyi sị ya, ‘Agaghị m eji mma agha gbuo gị.’
1KI 2:9 Ma achọghị m ka ị hapụ ya dịka onye ikpe na-amaghị. Ị bụ nwoke maara ihe. Ị makwaara ihe ị ga-eme ya. Mee ka o jiri isi awọ ọbara juru baa nʼili.”
1KI 2:10 Emesịa, Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. E liri ya na obodo Devid.
1KI 2:11 Ma ọ chịrị Izrel iri afọ anọ; ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem.
1KI 2:12 Solomọn nọdụrụ nʼocheeze nna ya Devid dịka eze. Alaeze ya guzosiri ike nke ukwuu. Ọchịchị ya gakwara nke ọma.
1KI 2:13 Otu ụbọchị, Adonaịja nwa Hagit, bịakwutere Batsheba, nne Solomọn. Mgbe Batsheba hụrụ ya, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụkwa ọbịbịa udo ka ị bịara?” Adonaịja zara sị ya, “E, abịara m nʼudo.”
1KI 2:14 O kwuru sị, “O nwere ihe m nwere ịgwa gị.” Nne Solomọn zara sị ya, “Kwuo.”
1KI 2:15 Ọ zara sị, “Dịka ị maara, ọ bụ m nwe alaeze a. Ndị Izrel niile lekwara anya na m ga-abụ eze ha. Ma otu ọ dị, ihe niile adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, alaeze a aghọọla nke nwanne m, nʼihi na o si nʼaka Onyenwe anyị rute ya aka.
1KI 2:16 Ugbu a, enwere m otu ihe m na-arịọ nʼaka gị. Biko ajụkwala imere m ya.” Batsheba sịrị ya, “Gịnị bụ arịrịọ gị? Kwuo ihe ọ bụ.”
1KI 2:17 Ọ zaghachiri ya sị, “Biko rịọrọ m Solomọn eze, nʼihi na amaara m na ọ ga-eme ihe ọbụla ị rịọrọ ya, ka ọ kpọnye m Abishag, nwanyị Shunem ahụ, ka ọ bụrụ nwunye m.”
1KI 2:18 Batsheba zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m agwara gị eze okwu.”
1KI 2:19 Emesịa, Batsheba bịakwutere eze Solomọn ịgwa ya okwu banyere Adonaịja. Mgbe ọ na-abata, eze sitere nʼocheeze ya bilie gaa izute ya, kpọkwaa isiala nye ya nọdụ ala nʼocheeze ya. O mere ka e butere nne eze ocheeze, ọ nọdụkwara ala nʼaka nri ya.
1KI 2:20 Ọ sịrị, “Enwere m arịrịọ nta m chọrọ ịrịọ gị. Ajụkwala i mere m ya.” Eze zaghachiri, “Rịọọ ya nne m. Agaghị m ajụ i mere gị ya.”
1KI 2:21 Ya mere ọ sịrị, “Biko, kwere ka enye nwanne gị nwoke Adonaịja Abishag nwanyị Shunem, ka ọ bụrụ nwunye ya.”
1KI 2:22 Eze Solomọn zara nne ya sị, “Gịnị mere i ji rịọọ m ka m nye Adonaịja naanị Abishag nwanyị Shunem ka ọ bụrụ nwunye ya? Ị gaara arịọkwa m sị m nye ya alaeze m. Nʼihi na ọ bụ ya tọrọ m” Ị gaara arịọkwa nʼihi Abịata onye nchụaja ma Joab nwa Zeruaya.
1KI 2:23 Mgbe ahụ, eze Solomọn ji Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na Adonaịja ejighị ndụ ya kwụọ ụgwọ nʼihi arịrịọ a.
1KI 2:24 Ugbu a, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ mere ka m nọgidesie ike nʼocheeze nna m Devid, onye mere ka ọchịchị eze m malite dịka o kwere na nkwa, a ga-eme ka Adonaịja nwụọ taa.”
1KI 2:25 Eze Solomọn zigara Benaya nwa Jehoiada ka ọ gaa gbuo Adonaịja. Benaya gakwara tigbuo Adonaịja.
1KI 2:26 Eze kpọkwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Laghachi azụ nʼubi gị nʼAnatot. I kwesiri ịnwụ ọnwụ ma ọ bụghị ugbu a ka a ga-egbu gị nʼihi na i buru igbe ọgbụgba ndụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼoge nna m Devid dị ndụ. I sokwa ya hụọ ahụhụ nʼoge ahụ niile o nwere nsogbu.”
1KI 2:27 Ya mere, Solomọn chụpụrụ Abịata ka ọ ghara ịbụ onye nchụaja Onyenwe anyị ọzọ. Otu a ka o si mezuo bụ okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru banyere ezinaụlọ Elayị na Shaịlo.
1KI 2:28 Ma mgbe Joab nụrụ na Adonaịja anwụọla, ọ gbaara ọsọ gaa nʼụlọ nzute Onyenwe anyị jigide mpi dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja aka. Ọ bụ ezie na Joab so Adonaịja gbaa izu imegide Solomọn, ma o soghị Absalọm gbaa izu imegide Devid.
1KI 2:29 Mgbe a gwara eze Solomọn, na Joab a gbabala nʼụlọ ikwu Onyenwe anyị, nọdụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja. Solomọn nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu sị, “Gaa, tituo ya nʼala.”
1KI 2:30 Benaya banyere nʼime ụlọ nzute Onyenwe anyị, sị Joab, “Eze sị gị, ‘pụta ezi!’ ” Ma ọ zara, “Mba, aga m anwụ nʼebe a.” Nʼihi nke a, Benaya jekwuru eze gwa ya ihe Joab kwuru.
1KI 2:31 Mgbe ahụ, eze nyere Benaya iwu sị ya, “Gaa mee dịka o kwuru. Gbuo ya, liekwa ya. Nke a ga-eme ka ikpe ọmụma ghara ịdịrị mụ na ezinaụlọ nna m Devid nʼihi ikpe ọmụma dịrị Joab maka ọbara ndị aka ha dị ọcha ọ wụsiri.
1KI 2:32 Onyenwe anyị ga-emekwa ka ọbara ọ wụsiri laa ya nʼisi, nʼihi na o ji mma agha gbuo ndị ikom abụọ, ma nna m Devid amaghị maka ya. Ha abụọ, ya bụ Abna nwa Nea, ọchịagha ndị Izrel, na Amasa nwa Jeta, ọchịagha ndị Juda, ndị dị mma ma bụrụkwa ndị ezi omume karịa ya.
1KI 2:33 Ka ikpe ọmụma dị nʼihi igbu ọchụ ndị a dịkwasị Joab na ụmụ ụmụ ya nʼisi ruo mgbe ebighị ebi. Ma nʼebe Devid na ụmụ ụmụ ya, na ụlọ ya, na ocheeze ya dị, ka udo Onyenwe anyị dịkwasị ha ruo mgbe ebighị ebi.”
1KI 2:34 Benaya nwa Jehoiada gara gbuo Joab. E liri ya nʼala nke ya dị nʼọzara.
1KI 2:35 Mgbe ahụ, eze họpụtara Benaya, nwa Jehoiada ka ọ bụrụ onyeisi ndị agha ya niile, ma mee Zadọk onye nchụaja nʼọnọdụ Abịata.
1KI 2:36 Emesịa, eze ziri Shimei ozi sị ya, “wuoro onwe gị ụlọ na Jerusalem, biri nʼebe ahụ, esitekwala nʼebe ahụ pụọ jee ebe ọbụla.
1KI 2:37 Nʼihi na ụbọchị ị ga-apụ gafee iyi dị na Ndagwurugwu Kidrọn, mara nke ọma na ị ghaghị ịnwụ. Ọbara gị ga-adịkwa gị nʼisi.”
1KI 2:38 Shimei zara eze, “Okwu gị dị mma. Ohu gị ga-eme dịka onyenwe m bụ eze kwuru.” Shimei biiri nʼime Jerusalem, nọọkwa ọtụtụ ụbọchị.
1KI 2:39 Ma nʼọgwụgwụ afọ atọ, ndị ohu abụọ Shimei nwere gbapụrụ ọsọ gbakwuru Akish, nwa Maaka, eze Gat. Ndị mmadụ bịara gwa Shimei sị ya, “Lee, ndị ohu gị nọ na Gat.”
1KI 2:40 Nke a mere ka o bilie, rịkwasị nʼelu ịnyịnya ibu ya, gaa Gat, jekwuru Akish nʼihi ịchọ ndị ohu ya. Shimei gara mee ka ndị ohu ya soro ya laghachite azụ.
1KI 2:41 Mgbe a gwara Solomọn na Shimei hapụrụ Jerusalem gaa Gat ma lọghachikwa azụ,
1KI 2:42 eze ziri ozi kpọọ Shimei sị ya, “Ọ bụ na m adọghị gị aka na ntị, jiri aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, ‘Mara nke ọma nʼụbọchị ọbụla ị ga-esi nʼebe a pụọ gaa nʼebe ọbụla ọzọ, na ị ga-anwụ?’ Nʼoge ahụ, ị zara m sị m, ‘Okwu gị dị mma. Aga m emekwa ya.’
1KI 2:43 Ọ bụ gịnị mere i ji mebie iyi ị ṅụrụ nye Onyenwe anyị, jụkwa idebe ihe m nyere gị nʼiwu?”
1KI 2:44 Eze gwakwara Shimei okwu sị ya, “I maara ihe ọjọọ niile i mere megide nna m Devid. Ugbu a Onyenwe anyị ga-akwụghachi gị ụgwọ nʼihi omume ọjọọ gị.
1KI 2:45 Ma eze Solomọn ga-abụ onye a gọziri agọzi. Ocheeze Devid ga-eguzosikwa ike nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.”
1KI 2:46 Mgbe ahụ, eze nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu ka o gbuo Shimei. Ọ pụkwara tituo ya, ọ nwụọ. Sitekwa nʼoge ahụ, alaeze Solomọn guzosiri ike nʼaka ya.
1KI 3:1 Solomọn na Fero eze Ijipt jikọtara onwe ha nʼotu, ọ lụrụ nwa nwanyị Fero. Ọ kpọbatara ya nʼobodo Devid ruo mgbe o wusiri ụlọeze ya na ụlọnsọ Onyenwe anyị, na mgbidi gbara Jerusalem gburugburu.
1KI 3:2 Nʼoge ahụ, ndị Izrel ka na-achụ aja ha nʼebe dị elu niile, nʼihi na ewubeghị ụlọnsọ ukwu nye aha Onyenwe anyị.
1KI 3:3 Ma Solomọn gosiri ịhụnanya nʼebe Onyenwe anyị nọ, site na ịgbaso ntụziaka niile nke Devid nna ya nyere ya, ọ bụ naanị na ọ chụrụ ọtụtụ aja dị iche iche, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe dị elu dị iche iche.
1KI 3:4 Eze gara Gibiọn nʼihi ịchụ aja, nʼihi na ebe ahụ bụ ebe kachasị mkpa, dị elu. Solomọn chụrụ otu puku aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.
1KI 3:5 Na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya na nrọ nke abalị, Chineke sịrị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.”
1KI 3:6 Solomọn zara sị, “I gosila ohu gị bụ nna m Devid obi ebere dị ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nye gị, onye ezi omume nakwa onye obi ya ziri ezi. Ị nọgidela na-egosi ya obi ebere dị ukwuu, nyekwa ya nwa nwoke ga-anọkwasị nʼocheeze ya nʼụbọchị taa.
1KI 3:7 “Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke m, i meela ohu gị eze nʼọnọdụ nna m, bụ Devid. Ma abụ m naanị nwantakịrị na-amaghị otu esi apụ ma na-abatakwa.
1KI 3:8 Ohu gị nọ nʼebe a, nʼetiti ndị gị ị họpụtara, ndị bara ụba nke ukwuu, ndị a na-adịghị agụta ọnụ nʼihi nʼọnụọgụgụ ha babigara ụba oke.
1KI 3:9 Ya mere, nye ohu gị uche nghọta nke m ga-eji chịa ndị gị, na ịghọta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe. Nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?”
1KI 3:10 Ọ masịrị Onyenwe anyị na Solomọn rịọrọ nke a.
1KI 3:11 Ya mere, Chineke zara sị ya, “Nʼihi na ị rịọrọ amamihe na nghọta ị ga-eji chịa ndị m, ma ị rịọghị m ka m nye gị ndụ ogologo, maọbụ akụnụba, maọbụ ọnwụ nye ndị iro gị.
1KI 3:12 Aga m eme dịka ihe ị rịọrọ si dị. Aga m enye gị obi maara ihe na uche ịghọta ihe ziri ezi, nke ga-abụ na ọ dịghị onye ọbụla dịka gị, ọ dịghịkwa onye ọbụla ga-adị ka gị.
1KI 3:13 Ọzọkwa, aga m enyekwa gị ihe ndị ahụ ị na-arịọghị m, akụnụba, na nsọpụrụ, ka ọ ga-abụ nʼụbọchị niile nke ndụ gị, ị gaghị enwe onye ọbụla ga-adị ka gị nʼetiti ndị eze niile.
1KI 3:14 Ọ bụrụkwa na i jee ije nʼụzọ m niile, debe iwu m, meekwa ihe m gwara gị, dịka nna gị Devid mere, aga m enye gị ogologo ndụ.”
1KI 3:15 Mgbe ahụ, Solomọn si nʼụra teta, ghọtakwa na ọ bụ nrọ ka ọ na-arọ. Ọ lọtara na Jerusalem bata guzo nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, chụọ aja nsure ọkụ na aja udo. Emesịa, o meere ndị na-ejere ya ozi oke oriri.
1KI 3:16 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ nwanyị akwụna abụọ bịakwutere eze, guzo nʼihu ya.
1KI 3:17 Otu nʼime ha gwara ya sị, “Onyenwe m, mụ na nwanyị a bi nʼotu ụlọ. Anyị abụọ dịkwa ime. Ma eburu m ya ụzọ mụọ nwa nke m.
1KI 3:18 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị ka m mụsịrị nwa, ya onwe ya mụkwara nwa nke ya. Naanị anyị abụọ bi, o nweghị onye ọzọ binyere anyị.
1KI 3:19 “Ma nʼotu abalị, nwa ya nwụrụ mgbe o dinakwasịrị ya nʼoge ọ na-arahụ ụra.
1KI 3:20 Mgbe o biliri nʼetiti abalị, chọpụtara na nwa ya anwụọla, o kuuru ya nibe ya nʼakụkụ m, kurukwanụ nwa nke m dị ndụ nibe nʼakụkụ ya onwe ya.
1KI 3:21 Nʼisi ụtụtụ, mgbe m tetara nʼụra chọọ inye nwa m ara, achọpụtara m na ọ nwụọla. Ma mgbe m leziri ya anya nke ọma ka chi bọrọ, ahụrụ m na nwa mụ na ya dina abụghị nwa nke m mụrụ.”
1KI 3:22 Mgbe ahụ, nwanyị nke ọzọ kwuru sị, “Mba, nwantakịrị ahụ dị ndụ bụ nwa m, ma nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị.” Nwanyị nke mbụ zara sị, “Mba, ọ bụghị eziokwu; nwa nke nwụrụ anwụ bụ nke gị, ma nke dị ndụ bụ nke m.” Otu a ka ha si na-arụrịta ụka nʼihu eze.
1KI 3:23 Eze kwuru sị, “Onye nke a na-asị, ‘Nwa m bụ nke dị ndụ, ma nke gị bụ nke nwụrụ anwụ,’ mgbe onye nke ọzọ na-asị, ‘Mba! Nwa gị bụ nke nwụrụ anwụ, ma nke m bụ nke dị ndụ.’ ”
1KI 3:24 Mgbe ahụ, eze sịrị, “Wetara m mma agha.” Ya mere, ha wetaara eze mma agha.
1KI 3:25 Eze nyere iwu sị, “Kpọwaa nwa ahụ dị ndụ ụzọ abụọ, were otu ọkara nye otu onye, werekwa nke ọzọ nye onye nke ọzọ.”
1KI 3:26 Nwanyị ahụ nwa ya dị ndụ jupụtara nʼọmịiko nʼebe nwa ya nọ, ọ gwara eze sị, “Biko, onyenwe m, kunye ya nwantakịrị ahụ dị ndụ. Egbukwala ya.” Ma onye nke ọzọ sịrị, “Kpọwaa ya abụọ. Nwa a agaghị abụ nke gị, ọ gaghị abụkwa nke m.”
1KI 3:27 Mgbe ahụ, eze kpebiri ikpe sị, “Kuru nwantakịrị a dị ndụ kunye ya nwanyị ahụ chọrọ ka ọ dị ndụ. Egbula ya, nʼihi na nwanyị ahụ bụ nne ya.”
1KI 3:28 Mgbe ndị Izrel niile nụrụ otu eze si kpebie ikpe a, ha sitere nʼịtụ egwu nye eze nsọpụrụ, nʼihi na ha hụrụ na o si nʼaka Chineke nweta amamihe ikpe ikpe ziri ezi.
1KI 4:1 Ya mere Solomọn ghọrọ eze ndị Izrel niile.
1KI 4:2 Ndị a bụ aha ndịisi ọchịchị obodo eze Solomọn họpụtara inyere ya aka. Azaraya, nwa Zadọk bụ onye nchụaja.
1KI 4:3 Elihoref na Ahija, ụmụ ndị ikom Shisha, bụ ndị ode akwụkwọ. Jehoshafat, nwa Ahilud bụ onye na-edekọ akụkọ.
1KI 4:4 Benaya, nwa Jehoiada bụ onyeisi agha ndị Izrel. Zadọk na Abịata, bụ ndị nchụaja.
1KI 4:5 Azaraya nwa Netan bụ onyeisi na-elekọta ndị na-ejere eze ozi. Zabud nwa Netan bụ onye nchụaja na onye ndụmọdụ nye eze.
1KI 4:6 Ahisha, bụ onyeisi na-elekọta nʼụlọeze. Adoniram nwa Abda bụ onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye.
1KI 4:7 Eze Solomọn họpụtara ndị ikom iri na abụọ ndị o mere ndịisi ga-elekọta akụkụ iri na abụọ nke o mere ka Izrel dịrị. Mmadụ iri na abụọ ndị a nwekwa ọrụ iwetara eze ihe oriri. Nwoke ọbụla nʼime ha nwe iwetara eze na ezinaụlọ ya ihe oriri otu ọnwa nʼafọ.
1KI 4:8 Nke a bụ aha ndị ikom iri na abụọ ahụ. Ben-Hua, onye na-achị ala ugwu ugwu Ifrem.
1KI 4:9 Ben-Deka, onye na-achị Makaz, na Shaalbim na Bet-Shemesh, na Elọn Bethanan.
1KI 4:10 Ben-Hesed, onye na-achị Arubot, na Soko, na Ala Hefa niile.
1KI 4:11 Ben-Abinadab, onye na-achị ala elu elu Doa. Nwoke a lụrụ Tafat, nwa nwanyị Solomọn.
1KI 4:12 Baana, nwa Ahilud, onye na-achị Teanak, na Megido nʼakụkụ Bet-Shan niile, nke dị nʼakụkụ Zaretan na ndịda Jezril, sitekwa na Bet-Shan ruo Ebel-Mehola gafee ma ruokwa Jokmeam.
1KI 4:13 Ben-Geba, onye na-achị Ramọt Gilead, na obodo niile nke ikwu Jaịa, nwa Manase nwere nʼime Gilead, na akụkụ Agob niile nke dị na Bashan, na iri obodo ukwu isii e ji mgbidi gbaa gburugburu, nke nwekwara mkpọrọ bronz e ji kpụọ ụzọ ya.
1KI 4:14 Ahinadab nwa Ido, onye na-achị Mahanaim.
1KI 4:15 Ahimaaz, onye na-achị Naftalị (ọ lụkwara nwa nwanyị Solomọn a na-akpọ Basemat).
1KI 4:16 Baana nwa Hushaị, onye na-achị Asha na Alot.
1KI 4:17 Jehoshafat nwa Parua onye na-achị Isaka.
1KI 4:18 Shimei nwa Ela onye na-achị Benjamin.
1KI 4:19 Gebea nwa Uri, onye na-achị Gilead (ala Saịhọn eze ndị Amọrait, na nke Ọg eze Bashan). Naanị ya ka e doro dịka gọvanọ ala ahụ.
1KI 4:20 Nʼoge a, ndị Juda na Izrel bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ha dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ha na-eri na-aṅụ, na-emekwa onwe ha obi ụtọ.
1KI 4:21 Ala niile Solomọn na-achị sitere nʼoke osimiri Yufretis ruo ala ndị Filistia, rukwaa nʼoke ala ndị Ijipt. Ndị niile a lụgburu nʼagha nʼobodo ndị a na-atụta ụtụ ha na-enye Solomọn. Ha nọgidekwara nʼokpuru Solomọn ụbọchị niile nke ndụ ya.
1KI 4:22 Ihe oriri a na-ewebata nʼụlọ Solomọn ụbọchị niile bụ otu narị bushel ụtụ ọka na iri bushel asatọ, na iri akpa ọka a kwọrọ akwọ isii,
1KI 4:23 na ehi iri mara abụba, na iri ehi abụọ a zụrụ nʼebe a na-azụ anụ, na narị atụrụ na ewu. A gụnyeghị anụ ele na mgbada na oke ele na ọkụkọ ọma a na-ewebata.
1KI 4:24 Nʼihi na ọ chịrị alaeze niile a ruo nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis, site na Tifsa ruo na Gaza. O nwekwara udo nʼakụkụ niile.
1KI 4:25 Nʼoge ndụ Solomọn niile, Juda na Izrel site na Dan ruo Bịasheba bi nʼudo. Nwoke ọbụla nọ nʼokpuru osisi vaịnị na nʼokpuru osisi fiig nke ya.
1KI 4:26 Ọnụọgụgụ ụlọ a na-etinye ụgbọ agha ịnyịnya na-adọkpụ nke Solomọn nwere dị puku anọ. Ọnụọgụgụ ịnyịnya a na-agba agba o nwere dị puku iri na abụọ.
1KI 4:27 Nʼọnwa ọbụla, ndị ahụ a họpụtara ịchị Izrel na-ewetara eze Solomọn na ndị ụlọ ya ihe oriri. Ha adịghị ekwekwa ka otu ihe kọọ nʼụlọ ya.
1KI 4:28 Ha na-ewetakwa ọka balị na ahịhịa ọka nʼebe o kwesiri, maka ịnyịnya na-adọkpụ ụgbọ agha na ịnyịnya ụkwụ ọsọ ndị ọzọ dịka ihe ha ketara nʼụtụ si dị.
1KI 4:29 Chineke nyere Solomọn amamihe, na uche nghọta, na mmụọ ịmụta ọtụtụ ihe nke bara ụba dịka aja dị nʼakụkụ osimiri.
1KI 4:30 Amamihe Solomọn dị ukwuu karịa amamihe ndị si ọwụwa anyanwụ. Nʼezie, ọ dị ukwuu karịakwa amamihe ndị maara ihe nʼIjipt.
1KI 4:31 Ọ maara ihe karịa onye ọbụla, karịa Etan onye Ezra, na Heman, na Kalkol, na Dada, ụmụ ndị ikom Mahol. Ihe banyere ịdị ukwuu ya gbasara na mba niile gbara ha gburugburu.
1KI 4:32 Ọ tụrụ puku ilu atọ, deekwa abụ ọnụọgụgụ ha dị otu puku na ise.
1KI 4:33 O kwuru okwu banyere osisi, site na osisi sida nke Lebanọn ruo nʼahịhịa hisọp nke na-eto na mgbidi aja, na ihe banyere ụmụ anụmanụ na anụ ufe, na anụ na-akpụgharị nʼala nakwa azụ.
1KI 4:34 Ndị eze niile dị nʼụwa bụ ndị bịara ịnụrụ banyere amamihe ya zitere ndị si na mba niile dị iche iche ịnụrụ okwu amamihe Solomọn.
1KI 5:1 Mgbe Hiram eze Taịa nụrụ na eteela Solomọn mmanụ ịbụ eze nʼọnọdụ nna ya Devid, o zipụrụ ndị ozi ya ijekwuru Solomọn, nʼihi na ya na Devid bụ enyi, dịrịkwa na mma.
1KI 5:2 Mgbe ahụ, Solomọn zigara Hiram ozi, sị ya:
1KI 5:3 “Ị maara na Devid nna m enweghị ike iwu ụlọnsọ ukwuu nye Aha Onyenwe anyị Chineke ya, nʼihi agha niile ọ lụrụ mgbe ọ dị ndụ. Ọ nọkwa na-eche ka Onyenwe anyị nye ya udo.
1KI 5:4 Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke m enyela m udo nʼakụkụ ọbụla. Enwekwaghị m ndị iro, ma ọ bụkwanụ ihe ndakwasị ọjọọ ọbụla.
1KI 5:5 Nʼihi ya, ana m achọ iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, dịka Onyenwe anyị gwara nna m Devid mgbe ọ sịrị ya, ‘Nwa gị nwoke, onye m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị, ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’
1KI 5:6 “Ya mere, nye iwu ka e gbutuoro m osisi sida nke Lebanọn. Ndị ọrụ m ga-esoro ndị nke gị nʼọrụ a. Aga m akwụ gị ihe ọbụla i kpebiri bụ ụgwọ ọrụ ha. Ị maara na anyị enweghị ndị ọka igbutu osisi dịka ndị Saịdọn.”
1KI 5:7 Mgbe Hiram nụrụ ozi Solomọn ziri, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu. O kwuru sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị taa, nʼihi na o nyela Devid nwa nwoke nwere amamihe ịchị mba ukwuu a.”
1KI 5:8 Ya mere, Hiram zigaara Solomọn ozi sị, “Anụla m ozi i ziteere m. Aga m emekwa ihe niile dịka i kwuru banyere i budatara gị osisi sida na osisi junipa.
1KI 5:9 Ndị ohu m ga-esi nʼugwu Lebanọn budaruo ha nʼosimiri Mediterenịa. A ga-ekekọta ha ọnụ, zitere gị ha nʼebe ị chọrọ ịnọ buru ha. Mgbe ha sere nʼelu mmiri rute ebe ị chọrọ, anyị ga-atọsakwara gị ha, ka i buru ha. Ma gị onwe gị ga-eme ihe bụ ọchịchọ m, site na-inye ndị ụlọ m ihe oriri.”
1KI 5:10 Nʼụzọ dị otu a, Hiram nọgidere na-ezitere Solomọn osisi sida na junipa niile ọ chọrọ.
1KI 5:11 Solomọn nyere Hiram na ezinaụlọ ya narị puku bushel, na iri puku bushel ọka wiiti abụọ, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ ya, tinyekwara narị puku galọọnụ, na iri puku galọọnụ abụọ nke mmanụ oliv asụrụ asụ. Solomọn nọgidere na-enye Hiram ihe ndị a kwa afọ.
1KI 5:12 Onyenwe anyị nyere Solomọn amamihe dị ukwuu dịka o kwere ya na nkwa. Hiram na Solomọn nwere mmekọ udo, ha abụọ gbakwara ndụ.
1KI 5:13 Eze Solomọn, sitere nʼakụkụ Izrel niile kpọbata ndị ọrụ mmanye ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ.
1KI 5:14 Nʼotu ọnwa, ọ na-eziga puku mmadụ iri nʼime ndị a ka ha gaa Lebanọn ịrụ ọrụ. Nʼọnwa ọzọ, ọ na-ezigakwa puku mmadụ iri ka ha gaa gbanwee ndị buuru ụzọ gaa. Nʼụzọ dị otu a, otu ụzọ nʼime iri puku mmadụ atọ ndị a na-anọ na Lebanọn otu ọnwa maka ịrụ ọrụ, ma ha na-alọta zuo ike ọnwa abụọ. Adoniram bụ onyeisi ndị ọrụ mmanye a.
1KI 5:15 Solomọn nwere ndị ọrụ ọzọ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa na-ebu ibu, nweekwa ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ.
1KI 5:16 Nʼagụnyeghị ndị a, o nwekwara ndịisi, ndị na-elekọta ndị ọrụ ndị a, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị atọ.
1KI 5:17 Dịka iwu eze si dị, ha na-esite nʼebe a na-awa nkume ebupụta nkume dị mma buru ibu nke e ji ewu ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ
1KI 5:18 Ndị ikom si Gebal, nyere ndị ọrụ Solomọn na ndị ọrụ Hiram aka, igbutu osisi na ịwa ha. Ha nyekwara aka ịkwado nkume e ji ewu ụlọ ahụ.
1KI 6:1 Solomọn bidoro iwu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ nʼọnwa Zif, bụ ọnwa nke abụọ nʼafọ nke anọ nke ịbụ eze ya. Ọ bụkwa nʼafọ nke mere ya narị afọ anọ na iri afọ asatọ site nʼoge ndị Izrel si nʼala Ijipt pụta.
1KI 6:2 Ụlọnsọ nke eze Solomọn wuuru Onyenwe anyị dị iri mita abụọ na asaa nʼogologo, mita itoolu nʼobosara, ebe ịla elu ya dịkwa mita iri na anọ.
1KI 6:3 Mpụta ọnụ ụlọ nke dị nʼihu ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ahụ dị mita itoolu nʼogologo nke gbakwunyere ihe nʼobosara ụlọnsọ ahụ, dịrịkwa mita anọ na ọkara nʼobosara ya.
1KI 6:4 O meere ụlọnsọ ahụ oghereikuku kpara nkpa nʼime ma saa mbara nʼezi, nʼebe elu elu mgbidi ụlọ ahụ.
1KI 6:5 Nʼakụkụ mgbidi ụlọ ezumezu ahụ nakwa mgbidi nke ime ebe nsọ ahụ, o wuru okpukpu gburugburu ụlọ ahụ, nke nwere ọtụtụ ụlọ nta dị iche iche gbaa gburugburu.
1KI 6:6 Obosara okpukpu ụlọ nke dịkarịsịrị ala bụ mita abụọ na ọkara, obosara okpukpu nke ụlọ etiti dị mita atọ, otu a kwa, obosara okpukpu ụlọ nke atọ dị mita atọ na ọkara. Mgbe e wuru mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu, e wukwara ihe dịka aka nʼakụkụ mgbidi ahụ niile. Ọ bụ nʼelu ihe ndị a dịka aka ka e dokwasịrị osisi e ji wuo ọnụụlọ nta ndị ahụ. Nʼụzọ dị otu a, ka e ji gbochie ịmanye ihe ọbụla nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ.
1KI 6:7 Mgbe a na-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, ọ bụ naanị nkume awara nke ọma nʼebe a nọ gwupụta ha ka eji wuo ya. O nweghị onye nụrụ ụzụ itipịa nkume, maọbụ ụzụ ịwa osisi, maọbụ ụdị mkpọtụ ahụ ngwa ọrụ mkpirisi igwe na-eme, nʼebe a nọ wuo ụlọnsọ ukwu ahụ, mgbe a na-ewu ya.
1KI 6:8 Ọnụ ụzọ e si abata nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ụlọ elu nke mbụ dị nʼakụkụ aka nri nke ụlọnsọ ukwu ahụ. E nwekwara ụzọ nrigo e wuru e si abanye nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ndị dị nʼetiti. A na-esitekwa na nke a rigoro ruo na nke atọ.
1KI 6:9 Mgbe o wusiri ụlọnsọ ukwu a, Solomọn jiri ibe osisi na osisi dị obosara e si nʼosisi sida mepụta, wuo ihe mgbachị elu ụlọ ahụ.
1KI 6:10 O wuru ọtụtụ ọnụụlọ nta nʼakụkụ mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu. Ọ bụkwa osisi sida ka e ji jikọta mgbidi ụlọ ahụ na ọnụụlọ nta ndị ahụ. Ịdị elu nke ọbụla nʼime ha bụ mita abụọ na ọkara.
1KI 6:11 Okwu Onyenwe anyị rutere Solomọn ntị,
1KI 6:12 “Banyere ụlọnsọ ukwu a i na-ewu, ọ bụrụ na i mee ihe m gwara gị, gbasoo ihe niile m nyere gị nʼiwu, ma mezuo okwu m niile, aga m esite na gị mezuo nkwa ahụ m kwere nna gị Devid.
1KI 6:13 Aga m ebikwa nʼetiti ndị Izrel, agaghị m ahapụkwa ndị m, Izrel.”
1KI 6:14 Emesịa, Solomọn wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ.
1KI 6:15 O ji osisi sida dị obosara machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ site nʼakụkụ ala ruo nʼelu ya. E jikwa osisi junipa machie ala ụlọ ahụ niile.
1KI 6:16 O ji osisi sida kewapụta ihe ruru mita itoolu nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, site nʼala ụlọ ahụ ruo nʼelu, nʼihi iwepụta site nʼụlọnsọ ahụ, ime ime ebe nsọ, nke bụ Ebe Kachasị Nsọ.
1KI 6:17 Ụlọ ezumezu nke dị nʼihu ọnụụlọ a dị iri mita na asatọ.
1KI 6:18 Ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ bụ osisi sida, nke a tụrụ ihe ọtụtụ nke oyiyi afụfa ọhịa na okoko osisi wasara awasa nʼelu ya. Ihe niile dị nʼime ụlọ ahụ bụ osisi sida, adịghị ahụ nkume ọbụla anya.
1KI 6:19 Ọ kwadokwara ebe nsọ ahụ, ebe dị nʼime ime ụlọ ahụ, maka idebe igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nʼebe ahụ.
1KI 6:20 Ime ime ebe nsọ ahụ, dị mita iri nʼogologo, obosara ya dịkwa mita iri, ịdị elu ya dịkwa mita iri. O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọ a niile, jiri osisi sida machie ebe nchụaja ya.
1KI 6:21 Solomọn ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ gbatịrị ụdọ ọlaedo gafere nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ, nke e jikwa ọlaedo machie.
1KI 6:22 Ya mere, o ji ọlaedo machie ime ya niile. O jikwa ọlaedo machie ebe ịchụ aja nke dịịrị ime ime ebe nsọ ahụ.
1KI 6:23 O mere cherubim abụọ, nke e ji osisi oliv tụọ nʼime ime ebe nsọ ahụ, ịdị elu nke ọbụla bụ mita ise.
1KI 6:24 Cherub nke mbụ nwere nku abụọ, otu nku dị mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, nku nke ọzọ dịkwa mita abụọ na ụma atọ nʼogologo. Ya bụ, mita ise site na ụma isii, site nʼọnụ otu nku ruo nʼọnụ nku nke ọzọ.
1KI 6:25 Cherub nke abụọ dịkwa iri mita na ụma isii, nʼihi na cherubim abụọ ndị a bụ otu nʼọtụtụ nakwa nʼibu ibu.
1KI 6:26 Ịdị elu nke cherub ọbụla ruru mita ise na ụma isii.
1KI 6:27 O tinyere cherubim ndị a nke gbasapụrụ nku ha nʼime ime Ebe Nsọ Kachasị Nsọ nke ụlọnsọ ukwu. Ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ otu akụkụ ahụ ụlọ ahụ, ebe ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ na nke ibe ya nʼetiti ọnụụlọ ahụ.
1KI 6:28 O jiri ọlaedo machie cherubim ndị ahụ.
1KI 6:29 Nʼahụ aja ụlọnsọ ukwu ahụ gbaa gburugburu, ma nʼime ọnụụlọ nke dị nʼime na ndị dị na mpụta, ka ọ pịkwasịrị oyiyi cherubim, osisi nkwụ na okoko osisi wara awa.
1KI 6:30 O jikwa ọlaedo machie ala ụlọ nke ọnụụlọ niile dị nʼime ụlọ, na ọnụụlọ ndị dị na mpụta ụlọnsọ ukwu ahụ.
1KI 6:31 O ji osisi oliv mee ibo ọnụ ụzọ mbata nke ime ime ebe nsọ ahụ, osisi ndị a bụ otu ụzọ nʼụzọ ise nke obosara ebe nsọ ahụ.
1KI 6:32 Nʼahụ ibo abụọ ahụ nke si nʼosisi oliv, ọ tụnyere oyiyi cherubim abụọ, igu nkwụ na okoko osisi wara awa. O ji ọlaedo etipịara etipịa machie oyiyi cherubim na igu nkwụ ndị ahụ.
1KI 6:33 Otu a kwa, o ji osisi oliv mee mbudo ibo ọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ ezumezu ahụ, nke bụ otu ụzọ na nkewa anọ nke obosara ụlọ ezumezu ahụ.
1KI 6:34 O jikwa osisi junipa mee ibo abụọ a na-emechikọta nʼotu.
1KI 6:35 Ọ pịrị oyiyi cherubim na oyiyi nkwụ, na oyiyi okoko osisi wara awa, jiri ọlaedo techie ibo ndị ahụ na oyiyi a pịkwasịrị ha.
1KI 6:36 O wuru ogige nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ bụ ahịrị nkume atọ e doziri edozi na otu ahịrị osisi sida a kwachara nke ọma ka e ji wuo ogige a.
1KI 6:37 Ọ bụ nʼọnwa Ziv, nʼafọ nke anọ, nke ịbụ eze Solomọn ka a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
1KI 6:38 Ọ bụ nʼime afọ iri na otu, nʼọnwa Bul, ya bụ ọnwa nke asatọ, ka e wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼihe niile ya dịka ntụziaka e nyere si dị. Ọ bụ afọ asaa ka o weere ya i ji rụchaa ụlọnsọ ukwu ahụ.
1KI 7:1 Solomọn ji afọ iri na atọ wuo ụlọ nke ya, bịa ruchakwaa ụlọ ya niile.
1KI 7:2 O wuru ụlọeze ukwu aha ya bụ Oke Ọhịa Lebanọn, nke ogologo ya dị iri mita ise, obosara ya dị iri mita abụọ na ise. Otu a kwa, ịdị elu ya dị mita iri na ise. Osisi sida ukwu e ji rụọ elu ya ka e mere ka ha nọkwasị nʼelu ogidi e doro nʼahịrị nʼahịrị. Ahịrị ogidi ndị a dịkwa anọ.
1KI 7:3 Ọ bụkwa osisi sida ka e ji machie elu ụlọ ahụ. A kụkwasịrị osisi ndị a nʼelu osisi sida ukwu ndị a a wara awa, ndị e mere ka ha nọkwasị nʼogidi ndị ahụ. Ọnụọgụgụ osisi ndị ahụ bụ iri anọ na ise. Ọ bụkwa iri na ise ka e nwere nʼahịrị ọbụla.
1KI 7:4 Oghereikuku ya dịkwa nʼụzọ ahịrị atọ, otu nʼelu ibe ya. E mere ka oghereikuku ndị dị nʼelu nʼotu akụkụ chee oghereikuku ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ ihu.
1KI 7:5 Ọnụ ụzọ niile nwere mbudo ọnụ ụzọ anọ. Ha dị atọ atọ cherịtara ibe ha ihu nʼebe mpụta ya.
1KI 7:6 O wuru ọnụ ụzọ mbata nke ogidi, nke ruru iri mita na anọ nʼobosara, rukwaa iri mita anọ na ise nʼịdị ogologo. Nʼihu ya, e nwere mpụta ọnụ ụlọ, nʼihu ya, e nwekwara ogidi na elu ebe kpuchiri ekpuchi.
1KI 7:7 E nwekwara ọnụ ụlọ ọzọ a na-akpọ, Ụlọ Ocheeze, maọbụ Ụlọ Ikpe ziri ezi ebe Solomọn na-anọ ekpe ikpe. E ji osisi sida machie ahụ ya niile, site nʼala ruo nʼelu.
1KI 7:8 Ụlọ obibi Solomọn dịkwa nʼogige dị nʼazụ ụlọ ikpe a. E wukwara ya dịka e si wuo ụlọ ndị ọzọ. Solomọn wukwaara nwunye ya ụlọ yiri nke ya. Nwanyị a bụ nwa Fero, eze ndị Ijipt, nke Solomọn na-alụ.
1KI 7:9 E ji nkume dị mma ma dịkwa oke ọnụahịa nke a wara awa na nke a kwadoro nke ọma nʼime na nʼezi dịka ọtụtụ si dị, wuo ụlọ ndị a. Site na ezi ruo nʼogige ukwu ahụ ma sitekwa na ntọala ruo nʼelu ya.
1KI 7:10 Nkume e ji tọọ ntọala ụlọ ndị a bụ nkume buru ibu, ndị dị ezi mma. Ụfọdụ nʼime nkume ndị a ruru mita anọ na ọkara nʼogologo, ndị ọzọ dị mita atọ na ụma isii.
1KI 7:11 Nʼelu nkume ndị a ka e doro nkume ndị ọzọ, ndị dị ezi mma, a waziri awazi dịka ọtụtụ si dị. Emesịa, e dokwara osisi sida nʼelu ha.
1KI 7:12 Ogige ukwu ahụ bụ nke eji ahịrị nkume atọ a wara awa dịkwasịrị nʼelu ibe ya gbaa gburugburu, otu ahịrị bụ nke sida a wara awa dịka ọ dị nʼime ime ogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, ya na mpụta ọnụ ụlọ ya.
1KI 7:13 Eze Solomọn zigara ozi na Taịa, ka a kpọta Huram.
1KI 7:14 Nne Huram bụ nwanyị si nʼebo Naftalị nke di ya nwụrụ anwụ, ma nna ya bụ onye Taịa, onye maara ǹka dị nʼịkpụ bronz. Huram jupụtara nʼamamihe na nghọta nʼihe ọmụma ịrụ ọrụ ọbụla metụtara bronz. Ọ bịakwutere eze bụ Solomọn, rụọkwa ọrụ niile enyere ya ịrụ.
1KI 7:15 Ọ kpụrụ ogidi bronz abụọ, nke ọtụtụ ya ruru mita asatọ na otu ụma nʼogologo, na mita ise na ụma anọ gburugburu ya.
1KI 7:16 Ọ kpụkwara ihe ọkpụkpụ bronz, nke isi ya yiri ọnụ ite mmiri. A dọkwasịrị ha nʼelu ogidi ọla abụọ ahụ. Otu nʼime ihe ọkpụkpụ bronz abụọ ndị a dị ihe ruru mita abụọ na ụma atọ nʼogologo.
1KI 7:17 E nwekwara ihe e ji chọọ ha mma. Ọ bụ ọla akpara akpa, nke yiri ụdọ a tụrụ atụ ka e ji chọọ ha mma. Asaa dị nʼotu ihe ọkpụkpụ ọla.
1KI 7:18 Ọ kpụrụ ihe yiri mkpụrụ pomegranet, nke dị nʼahịrị abụọ, nke o ji gbaa ihe ịchọ mma ndị ahụ gburugburu, maka iji ha chọọ ihe ọkpụkpụ ọla ndị ahụ dị nʼelu ogidi ndị ahụ mma. O mere otu ihe a maka ihe ọkpụkpụ ọla ọbụla.
1KI 7:19 Ihe ọkpụkpụ ọla ndị dị nʼelu ogidi dị na mgbe ụlọ ka o mere ka ha yie okoko osisi lili. Ịdị elu ha ruru otu mita na ụma asatọ.
1KI 7:20 Nʼelu ihe ọkpụkpụ ọla dị nʼogidi abụọ ahụ, nʼelu elu ha, ebe ahụ yiri ọnụ ite mmiri nke dị nʼakụkụ ihe ọkpụkpụ ọla ahụ, e nwere ihe yiri narị mkpụrụ pomegranet abụọ e doro nʼahịrị nʼahịrị gburugburu ha.
1KI 7:21 O guzobere ogidi abụọ ndị ahụ na mgbe ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ. Ogidi nke dị na ndịda ka ọ kpọrọ Jakin, ma nke dị nʼugwu ka ọ kpọrọ Boaz.
1KI 7:22 Ihe ọkpụkpụ ọla dị nʼelu ogidi ndị a bụ nke yiri okoko osisi lili. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si rụzuo ọrụ niile metụtara ogidi ndị ahụ.
1KI 7:23 O mekwara Oke osimiri nke ọla awụrụ awụ, nke dị gburugburu nʼụdịdị. Ọtụtụ ya bụ mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, dịkwa mita ise na ụma atọ, site nʼotu ọnụ ruo nʼọnụ nke ọzọ. Ọ bụ eriri e ji atụ ihe ruru ihe dịka mita iri na anọ ka e ji tụọ ya gburugburu.
1KI 7:24 Nʼokpuru ọnụ ya, oyiyi ọba gbara ya gburugburu, iri dị na mita anọ na ọkara ọbụla. Ọba ndị a dị nʼahịrị abụọ, awụkọtara ha na Oke osimiri ahụ otu mgbe.
1KI 7:25 E mekwara ka Oke osimiri ahụ guzo nʼelu ehi iri na abụọ. Atọ na-eche ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼọdịda anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼakụkụ ndịda, atọ na-eche ihu nʼakụkụ ugwu. Oke osimiri ahụ dịkwasịrị ha nʼelu, ebe azụ ha niile dị nʼime nʼetiti.
1KI 7:26 Ịdị arọ ya ha ka otu ọtụtụ ntu-aka dimkpa. E mere ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko mmiri, dịkwa ka okoko lili na-awapụta awapụta. Ọ na-erite puku galọọnụ iri na abụọ.
1KI 7:27 O mekwara ihe ndọkwasị bronz iri, nke e nwere ike ịkpụgharị akpụgharị. Mita abụọ ka ogologo nke otu ihe ndọkwasị ọbụla dị, mita abụọ ka obosara ya dịkwa; ịdị elu ya dị otu mita na ọkara.
1KI 7:28 Ihe ndọkwasị ahụ nwere ihe e ji jikọta ya dị nʼetiti ya. Otu a ka e si mee ihe ndọkwasị ahụ.
1KI 7:29 Nʼelu ihe njikọta ahụ ka a wụrụ oyiyi dị iche iche, dịka ọdụm, na oke ehi, na ndị mmụọ ozi cherubim nwere nku. Nʼelu, na nʼokpuru ọdụm, na oke ehi ndị ahụ, a wụkwara ahịhịa na okoko osisi dị iche iche.
1KI 7:30 Otu ihe ndọkwasị ọbụla nwere ụkwụ bronz anọ dị gburugburu, nweekwa okporo bronz ebe ụkwụ ndị a na-agbagharị. Nʼakụkụ anọ nke ihe ndọkwasị ndị a, a rụnyere ebe a na-adọkwasị efere. E ji oyiyi okoko osisi na ahịhịa chọọ ihe ndị a mma.
1KI 7:31 Nʼime ihe ndọkwasị ahụ, e nwere oghere nke nwere ọnụ dị gburugburu nke ịdị omimi ya bụ sentimita iri anọ na ise. Oghere a dị gburugburu, nwee ebe ndọkwasị nʼokpuru ya nke dị sentimita iri isii na asatọ nʼọtụtụ. Oyiyi ihe apịrị apị dịkwa gburugburu ọnụ ya. Ihe njikọta ha niile nwere akụkụ anọ nke ha nʼotu, ha adịghị gburugburu.
1KI 7:32 A na-adọkpụgharị ihe ndọkwasị a nʼụkwụ anọ o nwere. A dụnyekọtakwara ụkwụ anọ ndị a nʼime okporo ọla e mekọtara ya na ihe ndọkwasị ahụ. Ịdị elu nke ụkwụ ọbụla bụ iri sentimita isii na asatọ.
1KI 7:33 E mekwara ụkwụ ndị a dịka ụkwụ ụgbọala nke ịnyịnya na-adọkpụ. Ọ bụkwa ọla ka e ji kpụọ akụkụ ihe ndọkwasị ahụ niile, ma okporo igwe ukwu, ma okporo igwe nta, na ihe niile jikọtara ha.
1KI 7:34 Ụkwụ ọla nta anọ dịkwa nʼokpuru ihe ndọkwasị ahụ, nʼakụkụ ọbụla. A wụkọtakwara ha na ihe ndọkwasị ahụ.
1KI 7:35 E nwere ihe a magidere gburugburu nʼelu ihe ndọkwasị ọbụla, nke omimi ya dị iri sentimita abụọ na ụma atọ. Ọla a, na ụkwụ ya, ka a wụkọtara na ihe ndọkwasị ahụ otu mgbe.
1KI 7:36 Ebe ọbụla ohere dị, o gbunyere oyiyi cherubim nwere nku, na oyiyi ọdụm, na oyiyi osisi nkwụ, nʼahụ ibo ọla ahụ e mere ka ọ dịrị gburugburu elu ihe ndọkwasị ọla ahụ.
1KI 7:37 Ihe ndọkwasị ọla iri ndị ahụ ha otu. Ha yikwara ibe ha, nʼihi na e mere ka ha nwee otu ụdị.
1KI 7:38 Huram jikwa bronz kpụọ efere ịsa ihe iri. Ogbu efere ọbụla dị mita abụọ na otu ụma, otu efere maka ihe ndọkwasị ọbụla. Mmiri na-eju otu nʼime ha bụ narị galọọnụ mmiri abụọ na iri anọ.
1KI 7:39 Ọ dọnyere ihe ndọkwasị ọla ise nʼakụkụ ndịda ụlọnsọ ukwu ahụ, dọnyekwa ihe ndọkwasị ọla ise nke ọzọ nʼakụkụ ugwu. Ọ dọbara ihe ichenye mmiri ukwu ahụ nʼakụkụ ndịda, nʼihu ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ahụ, nʼebe chere ihu na ndịda.
1KI 7:40 Ọ kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ.
1KI 7:41 Ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ abụọ dịka efere dị nʼelu ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ yiri ụdọ a tụrụ atụ nke e ji chọọ ihe ọkpụkpụ abụọ ahụ dịka efere mma.
1KI 7:42 Narị anọ nke mkpụrụ pomegranet a kpụrụ akpụ maka ahịrị ihe abụọ ahụ a kpụrụ akpụ, ya bụ, ahịrị pomegranet abụọ nʼihi otu ihe ọkpụkpụ, iji chọọ ihe ọkpụkpụ ahụ yiri efere dị nʼisi elu ogidi ahụ mma.
1KI 7:43 Ihe ndọkwasị iri na efere ịsa mmiri iri nke dọkwasịrị nʼelu ha;
1KI 7:44 na Oke osimiri ahụ na oke ehi iri na abụọ ahụ dị ya nʼokpuru;
1KI 7:45 ite niile, shọvel niile na efere ịkwọsa mmiri. Ihe ndị a niile nke Huram meere eze Solomọn nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ bronz na-egbu maramara ka eji mee ha.
1KI 7:46 Ọ bụ nʼala ụrọ, nʼobosara ala Jọdan, nʼetiti Sukọt na Zaretan ka eze mere ka a nọrọ kpụọ ihe ndị a.
1KI 7:47 Ma Solomọn atụghị ihe ndị a niile a kpụrụ nʼihe ọtụtụ, nʼihi na ha dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ, achọpụtaghịkwa ịdị arọ nke bronz ahụ.
1KI 7:48 Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, ya bụ: ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, tebul ọlaedo nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị.
1KI 7:49 E jikwa ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna, ise nʼakụkụ aka nri, ise nʼakụkụ aka ekpe, nʼihu ime ime ebe nsọ; tinyere ihe ịchọ mma oyiyi okoko osisi, na oriọna niile, na ihe ịgụta ihe niile;
1KI 7:50 na efere ọlaedo a nụchara anụcha dị iche iche, na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri, na ngaji na ihe ịgụ ọkụ; na ihe ikonye ibo nʼihi ibo ọnụụlọ ndị dị nʼime ime, bụ Ebe Kachasị Nsọ, nakwa ibo ndị dị nʼọnụ ụzọ ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ukwu.
1KI 7:51 Mgbe a rụzuru ọrụ niile nke eze Solomọn nwere ịrụ maka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, o webatara ihe niile Devid bụ nna ya doro nsọ nʼime ya, ya bụ ọlaọcha, ọlaedo na ngwongwo ndị ọzọ niile. O tinyere ha nʼụlọakụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
1KI 8:1 Mgbe ahụ, eze Solomọn kpọkọtara ndị okenye Izrel, na ndịisi ebo niile, na ndịisi ezinaụlọ Izrel niile, ka ha bịakwute eze na Jerusalem, maka i site na Zayọn bụ obodo Devid bugota igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
1KI 8:2 Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute eze Solomọn nʼoge a na-eme mmemme nʼọnwa Etanim nke bụ ọnwa asaa nʼafọ.
1KI 8:3 Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị nchụaja buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ.
1KI 8:4 Ha bugotara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ya na ụlọ nzute, na ngwongwo niile dị nsọ dị nʼime ya. Ndị nchụaja na ndị Livayị buliri ha elu.
1KI 8:5 Eze Solomọn na ọgbakọ Izrel niile, bụ ndị zukọtara nʼebe ọ nọ, nọ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na-achụ aja ọtụtụ atụrụ na ọtụtụ ehi nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ gbakọta ọnụọgụgụ ha nʼihi ịba ụba.
1KI 8:6 Ndị nchụaja bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼime Ebe Kachasị Nsọ, dọba ya nʼokpuru nku cherubim ahụ.
1KI 8:7 Cherubim ndị ahụ gbasara nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, zochie igbe ọgbụgba ndụ ahụ na okporo osisi ndị e ji ebu ya.
1KI 8:8 Okporo osisi ndị a dị oke ogologo, na e nwere ike ị site nʼEbe Nsọ, dị nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ hụ isi ha anya, ma onye na-anọghị nʼEbe Nsọ ahụ adịghị ahụ ha. Ha ka dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
1KI 8:9 O nweghị ihe dị nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, karịakwa mbadamba nkume abụọ ahụ Mosis tinyere nʼime ya nʼugwu Horeb, nʼebe Onyenwe anyị na ụmụ Izrel gbara ndụ, mgbe ha si nʼala Ijipt pụta.
1KI 8:10 Mgbe ndị nchụaja si nʼEbe Nsọ ahụ pụta, igwe ojii jupụtara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ.
1KI 8:11 Ndị nchụaja enwekwaghị ike jee ozi ha, nʼihi igwe ojii ahụ, nʼihi na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼime ụlọnsọ ya.
1KI 8:12 Mgbe ahụ, Solomọn sịrị, “Onyenwe anyị ekwuola na ọ ga-ebi nʼoke igwe ojii.
1KI 8:13 Ma nʼezie, ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
1KI 8:14 Dịka ọgbakọ Izrel niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha.
1KI 8:15 Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, onye ji aka ya mezuo nkwa nke o sitere nʼọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị,
1KI 8:16 ‘Site nʼụbọchị ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta ndị m, ahọpụtaghị m obodo ọbụla nʼebo ọbụla nke Izrel, ka e wuru m ụlọnsọ ka Aha m dịrị nʼebe ahụ. Ma a họrọla m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’
1KI 8:17 “Nna m, Devid bu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.
1KI 8:18 Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.
1KI 8:19 Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, kama ọ bụ nwa gị nwoke, anụ ahụ gị na ọbara gị; ọ bụ ya ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’
1KI 8:20 “Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna m Devid, ugbu a, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.
1KI 8:21 Edoziekwala m ọnọdụ ebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ ga-adị, nʼime ya ka ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị dị, bụ nke ya na nna nna anyị ha gbara, mgbe o mere ka ha si nʼala Ijipt pụta.”
1KI 8:22 Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu,
1KI 8:23 kwuo sị, “Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe nke dị nʼelu, maọbụ nʼụwa, nʼokpuru eluigwe. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị.
1KI 8:24 I mezuokwala nkwa niile i kwere nna m Devid, bụ ohu gị. I ji ọnụ gị kwee nkwa a ma taa, i jirila aka gị mezuo ya.
1KI 8:25 “Ugbu a, O! Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, mezukwaa nkwa niile i kwere Devid nna m, mgbe ị sịrị, ‘Ọ bụrụ na ụmụ ụmụ gị elezie anya bie ndụ nʼụzọ kwesiri ntụkwasị obi nʼihu m, nʼihe niile ha na-eme, dịka gị onwe gị mere, agaghị achọ onye ga-anọ nʼihu m nʼocheeze Izrel nʼime ha.’
1KI 8:26 Ma ugbu a, Chineke nke Izrel, ka okwu gị, bụ nkwa nke i kwere ohu gị, bụ nna m Devid, bịa na mmezu.
1KI 8:27 “Ma ọ bụ ezie na gị Chineke ga-ebi nʼelu ụwa? Lee, eluigwe ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị?
1KI 8:28 Ma Onyenwe anyị Chineke m, ṅaa ntị nʼekpere ohu gị, na arịrịọ ọ na-arịọ maka ebere. Nụrụ akwa na ekpere nke ohu gị na-ekpe nʼihu gị taa.
1KI 8:29 Biko, mee ka anya gị abụọ ghere oghe nʼebe ụlọnsọ ukwu a dị, abalị na ehihie, bụ ebe a i kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adị nʼebe ahụ,’ ka i si otu a nụrụ ekpere nke ohu gị ga-ekpe banyere ebe a.
1KI 8:30 Nụrụkwa arịrịọ ohu gị na nke ndị gị Izrel niile, mgbe ọbụla ha chere ihu ha nʼebe a nʼekpere. Biko, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ, mgbe ị nụrụ biko, gbagharakwa.
1KI 8:31 “Mgbe onye ọbụla mehiere mmadụ ibe ya, a kpọọ ya oku ka ọ bịa ṅụọ iyi, onye dị otu a bịa, guzo nʼebe a, nʼihu ebe ịchụ aja gị a, ṅụọ iyi ahụ.
1KI 8:32 Mgbe ahụ, nụrụ olu ya nʼeluigwe ma mee ihe ziri ezi. Kpeekwa ikpe nʼetiti ndị ohu gị, maa onye mejọrọ ikpe site nʼịtụkwasị nʼisi ha ihe o metara, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya, site nʼimeso ha dịka ezi omume ha si dị.
1KI 8:33 “Mgbe ndị iro meriri ndị gị Izrel, nʼihi na ha mehiere megide gị, ọ bụrụ na ha alọghachikwute gị, too aha gị, na-ekpe ekpere, na-arịọ gị arịrịọ nʼụlọnsọ ukwu a,
1KI 8:34 biko, site nʼeluigwe nụrụ ekpere ha, gbaghara mmehie ndị gị Izrel. Meekwa ka ha lọghachita nʼala ahụ nke i nyere nna nna ha.
1KI 8:35 “Mgbe e gbochiri eluigwe, mee na mmiri adịghị ezokwa, nʼihi na ndị gị emehiela megide gị, ọ bụrụ na ha echee ihu nʼebe a kpee ekpere, too aha gị, si na mmehie ha chegharịa, nʼihi na ịtaala ha ahụhụ.
1KI 8:36 Biko, site nʼeluigwe nụrụ ma gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, bụ ndị gị Izrel. Kuziere ha ezi ụzọ ha ga-esi bie ndụ ma zidata mmiri ozuzo nʼala ahụ nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha.
1KI 8:37 “Mgbe ụnwụ maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe ga-adakwasị ala a, maọbụ ọrịa na-eripịa ihe ubi maọbụ ọmụma ebu, maọbụ igurube maọbụ ụkpana, maọbụ mgbe onye iro nọchibidoro ha nʼobodo ha niile, ihe mbibi niile maọbụ ọrịa ọbụla,
1KI 8:38 ekpere ọbụla maọbụ arịrịọ nke onye ọbụla nʼetiti ndị gị Izrel kpere ma rịọọ, nʼihi ịghọta ihe otiti niile nke obi ha, ha gbasapụ aka ha, ma chee ihu ha nʼebe ụlọnsọ ukwu dị,
1KI 8:39 mgbe ahụ, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Gbaghara ma meekwa; mesoo onye ọbụla dịka ihe niile ha na-eme si dị, ebe ọ bụ na ị maara obi ha niile, nʼihi na naanị gị maara obi mmadụ ọbụla,
1KI 8:40 ka ha tụọ egwu gị oge niile nke ha na-ebi nʼala ahụ nke i nyere nna nna anyị ha.
1KI 8:41 “Ma banyere onye mba ọzọ, onye na-esonyeghị na ndị gị Izrel, kama o si nʼala ebe dị anya bịa nʼihi Aha gị,
1KI 8:42 nʼihi na ha ga-anụ ihe banyere aha ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a,
1KI 8:43 mgbe ahụ, site nʼeluigwe ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Mekwaa ihe niile nke onye mba ọzọ ahụ na-arịọ nʼekpere, ka ndị niile nke ụwa mara aha gị, tụọkwa egwu gị, dịka ndị nke gị bụ Izrel na-eme, ka ha matakwa na-akpọkwasịrị Aha gị nʼụlọ a nke m wuru.
1KI 8:44 “Mgbe ndị gị ga-aga ibu agha megide ndị iro ha, nʼebe ọbụla ị na-eziga ha, mgbe ha chere ihu ha nʼụzọ obodo a nke ị họpụtara na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị, kpee ekpere nye Onyenwe anyị,
1KI 8:45 mgbe ahụ, site nʼeluigwe nụrụ ekpere na arịrịọ amara ha, mezukwa ihe ha na-arịọ (dịnyekwara ha).
1KI 8:46 “Mgbe ha mehiere megide gị, nʼihi na ọ dịghị mmadụ ọbụla na-adịghị emehie, ị wee iwe megide ha, rara ha nyefee nʼaka ndị iro ha, ndị dọkpụrụ ha nʼagha gaa nʼobodo ọzọ, maọbụ obodo dị anya maọbụ nke dị nso;
1KI 8:47 ọ bụrụ na ha anọrọ nʼala ahụ a dọkpụrụ ha gaa, chegharịa nʼobi ha, nọrọ nʼala ebe ahụ eji ha rịọọ gị, sị, ‘Anyị emehiela, anyị emeela ihe nʼadịghị mma, anyị emekwala ajọ omume’;
1KI 8:48 ọ bụrụ na ha ejiri obi ha na mmụọ ha niile chegharịa, nʼala ebe ndị iro ha, bụ ndị dọọrọ ha nʼagha, ma kpee ekpere nye gị chee ihu ha nʼụzọ ala a nke i nyere nna nna ha, nʼobodo a nke ị họpụtara, ya na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị;
1KI 8:49 mgbe ahụ, site nʼeluigwe, ebe obibi gị, nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha, nyekwara ha aka.
1KI 8:50 Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị, gbaghara njehie niile ha mere megide gị, ma meekwa ka ndị dọtara ha nʼagha gosi ha obi ebere.
1KI 8:51 Nʼihi na ha bụ ndị gị na oke gị, ndị i mere ka ha si nʼala Ijipt pụta, ala oke ịta ahụhụ nke nhụju anya.
1KI 8:52 “Ka anya gị ghere oghe nʼarịrịọ mụ bụ ohu gị, nakwa nʼarịrịọ ndị gị Izrel, biko, na-egekwa ha ntị mgbe ọbụla ha bekuru gị akwa.
1KI 8:53 Nʼihi na gị onwe gị kewapụtara ha site na mba niile nke ụwa ka ha bụụrụ gị ihe nketa, dịka ị kwupụtara site nʼọnụ ohu gị bụ Mosis, mgbe gị bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka nna nna anyị ha si nʼala Ijipt pụta.”
1KI 8:54 Mgbe Solomọn kpechara ekpere ndị a ya na arịrịọ ọ rịọrọ Onyenwe anyị o si nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, bụ ebe o gburu ikpere nʼala, bilie, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu.
1KI 8:55 O guzoro gọzie ọgbakọ Izrel niile, gwa ha okwu nʼoke olu sị ha,
1KI 8:56 “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye nyere ndị ya, Izrel izuike dịka o kwere na nkwa. Ọ dịkwaghị okwu ọbụla nke na-emezughị nʼime ezi nkwa ahụ niile o kwere site nʼọnụ Mosis ohu ya.
1KI 8:57 Ka Onyenwe anyị Chineke anyị dịnyere anyị, dịka o si dịnyere nna nna anyị ha. Ka ọ gharakwa ịhapụ anyị, maọbụ gbakụta anyị azụ.
1KI 8:58 Ya nyekwa anyị mmụọ ime ihe niile ọ chọrọ, dịka uche nsọ ya si dị, na mmụọ ijezi ije nʼụzọ ya niile, na idebe ụkpụrụ na iwu niile nke o nyere nna nna anyị ha.
1KI 8:59 Ka okwu m ndị a niile, nke m ji rịọ amara nʼihu Onyenwe anyị dịkwa Onyenwe anyị Chineke anyị nso ehihie na abalị. Ka o nyekwara ohu ya na ndị Izrel niile aka, dịka mkpa ụbọchị ọbụla si dị.
1KI 8:60 Ka ndị niile bi nʼụwa mara na Onyenwe anyị bụ Chineke, marakwa na o nweghị chi ọzọ dị karịa ya.
1KI 8:61 Ya mere, werenụ obi unu nyechasịa Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, kpamkpam, na-ebinụ ndụ nʼụkpụrụ ya, rubenụ isi nʼiwu ya, dịka ọ dị taa.”
1KI 8:62 Mgbe ahụ, eze ya na ndị Izrel niile chụrụ aja dị iche iche nʼihu Onyenwe anyị.
1KI 8:63 Solomọn chụrụ aja udo, bụ nke ọ chụrụ nye Onyenwe anyị. Ehi dị puku iri abụọ na abụọ, na ewu na atụrụ dị narị puku na iri puku abụọ. Ya mere, eze na ndị Izrel niile si otu a doo ụlọnsọ Onyenwe anyị nsọ.
1KI 8:64 Nʼotu ụbọchị ahụ kwa, eze doro etiti ogige dị nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ nsọ. Nʼebe ahụ ka ọ nọ chụọ aja nsure ọkụ, aja onyinye mkpụrụ ọka na aja abụba udo. O mere nke a nʼihi na ebe ịchụ aja bronz nke na-eguzo nʼihu Chineke dị oke nta ịbata aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka niile nakwa aja abụba udo niile ahụ.
1KI 8:65 Ya mere, Solomọn ya na ndị Izrel niile mere mmemme a nʼoge ahụ, ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na Lebo Hamat ruo na mmiri iyi Ijipt. Ha mere mmemme a nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, ụbọchị asaa tinyere ụbọchị asaa ọzọkwa, ya bụ agụkọta ha ụbọchị iri na anọ.
1KI 8:66 Nʼụbọchị nke na-eso ya, o zilagara ndị ahụ niile. Ha gọziri eze, laakwa nʼụlọ ha, nʼịṅụrị ọṅụ na obi ụtọ nʼihi ihe ọma niile nke Onyenwe anyị meere ohu ya Devid, na ndị ya Izrel.
1KI 9:1 Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, rụzukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime,
1KI 9:2 Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya anya nke ugboro abụọ dịka o mere ka ọ hụ ya anya na Gibiọn.
1KI 9:3 Onyenwe anyị sịrị ya, “Anụla m ekpere gị, na arịrịọ gị, nke ị rịọrọ nʼihu m. Edoola m ụlọnsọ a nke i wuru nsọ, site nʼitinye Aha m nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Anya m na obi m abụọ ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile.
1KI 9:4 “Ma gị onwe gị, ọ bụrụ na ị jiri obi zuruoke na omume ziri ezi, bie ndụ nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu m dịka Devid nna gị mere, na-eme ihe niile m nyere nʼiwu, debe ụkpụrụ m na iwu m niile,
1KI 9:5 mgbe ahụ, aga m eme ka ocheeze ọchịchị gị nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, dịka m kwere nna gị Devid nkwa, mgbe m sịrị, ‘Ị ghaghị inwe onye nnọchite anya nʼocheeze Izrel.’
1KI 9:6 “Ma ọ bụrụ na unu, maọbụ ụmụ ụmụ unu alaghachi azụ, site nʼebe m nọ, jụ idebe iwu na ụkpụrụ niile bụ nke m nyere unu, pụọ gbasoro chi ndị ọzọ ife ha ofufe na ịkpọ isiala nye ha,
1KI 9:7 mgbe ahụ, aga m esite nʼala ahụ nke m nyere ha wezuga Izrel. Aga m ajụkwa ụlọnsọ a m doro nsọ nye Aha m. Izrel ga-aghọ ihe eji atụ ilu na ihe ịkpa ọchị nʼetiti ndị niile.
1KI 9:8 Ọ bụ ezie na ụlọnsọ ukwu a kachasị elu ugbu a, ma ọnọdụ ya ga-eju ndị niile ga-esi nʼakụkụ ya gafee anya. Ha ga-emi ọnụ, sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ala a na ụlọnsọ a, ihe dị otu a?’
1KI 9:9 Ndị mmadụ ga-aza, ‘Nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị Chineke ha azụ, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’ ”
1KI 9:10 Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọ abụọ ndị a, ya bụ ụlọnsọ Onyenwe anyị na ụlọeze.
1KI 9:11 Eze Solomọn nyere Hiram, eze Taịa, iri obodo abụọ dị na Galili, nʼihi osisi sida, na osisi junipa, na ọlaedo niile Hiram butere ya dịka o si chọọ ya.
1KI 9:12 Ma mgbe Hiram si Taịa gaa ịhụ obodo ndị a nke Solomọn nyere ya, ha amasịghị obi ya.
1KI 9:13 Ya mere, ọ jụrụ sị, “Nwanne m nwoke, ụdị obodo dị aṅaa bụ ihe a i nyere m?” Nʼihi ya, ọ kpọrọ ha Kabul, aha ọ na-aza ruo taa.
1KI 9:14 Hiram zigaara eze ọlaedo dị puku kilogram anọ na iri asatọ.
1KI 9:15 Nke a bụ akụkọ banyere ndị ọrụ mmanye niile eze bụ Solomọn chịkọtara maka ịrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze nke ya, na ebe e wusiri ike nke Milo, na mgbidi Jerusalem, Hazọ, Megido nakwa Gaza.
1KI 9:16 Fero eze Ijipt buru agha na mbụ merie Gaza, kpọọ ya ọkụ, gbukwaa ọtụtụ ndị Kenan bi nʼobodo ahụ, were ya nye nwa ya nwanyị, bụ nwunye Solomọn, ka ọ bụrụ ihe o ji duo ya ụlọ.
1KI 9:17 Solomọn wugharịrị obodo Gaza, wuokwa ndịda Bet-Horon,
1KI 9:18 Baalat na Tadmọ nke dị nʼọzara nʼime ala ya.
1KI 9:19 O wukwara ọtụtụ obodo ebe nchịkọba ihe, obodo ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị.
1KI 9:20 Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Amọrait, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị ahụ abụghị ndị Izrel),
1KI 9:21 ndị ụmụ ụmụ ha niile fọdụrụ nʼala ahụ, ndị ahụ ndị Izrel na-enweghị ike egbuchapụ, ndị a ka Solomọn mere ndị ọrụ mmanye na ndị ohu, nke a bụkwa ọnọdụ ha ruo taa.
1KI 9:22 Ma Solomọn emeghị ka onye Izrel ọbụla bụrụ ohu. Kama ha bụ ndị ikom agha, ndịisi ọrụ nʼọchịchị, ndịisi ndị ọchịagha, ndịisi ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya agha ya.
1KI 9:23 Ndị a bụkwa ndịisi na-ahụ ihe banyere ọrụ niile nke Solomọn ji nʼaka. Ndị Izrel dị narị ise na iri ise (550), ka e mere ndịisi na-elekọta ndị ọrụ Solomọn.
1KI 9:24 Emesịa, ada Fero sitere nʼobodo Devid pụta gbagoo nʼụlọeze nke Solomọn wuuru ya. Solomọn wukwara ebe mpụta nke ụlọ ahụ.
1KI 9:25 Ugboro atọ nʼafọ, ka Solomọn na-achụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼelu ebe ịchụ aja o wuru nye Onyenwe anyị, tinyere aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ ọ na-achụ nʼihu Onyenwe anyị. O si otu a wuchaa ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
1KI 9:26 Eze Solomọn wukwara ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba, bụ nke dị nʼakụkụ Elat, nʼọnụ mmiri Oke osimiri Uhie nʼala Edọm.
1KI 9:27 Hiram zigaara ndị ikom ya na-anya ụgbọ, ndị maara ihe banyere ime njem osimiri nke ọma, ka ha soro ndị ikom Solomọn jee ozi nʼime ụgbọ ndị a.
1KI 9:28 Ha nyaara ụgbọ gaa Ọfịa, site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na anọ na narị abụọ na asatọ.
1KI 10:1 Mgbe eze nwanyị Sheba nụrụ akụkọ Solomọn, na ịdị na mma nke dị nʼetiti ya na Onyenwe anyị, ọ bịara ka o were ọtụtụ ajụjụ siri ike nwalee Solomọn.
1KI 10:2 Ọ bịarutere Jerusalem, ya na ọtụtụ ndị ozi nʼebe ha bara ụba, ndị so ya, tinyere ọtụtụ ịnyịnya kamel ndị bu ụda dị iche iche, ọtụtụ ọlaedo na nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche. Ọ bịakwutere Solomọn, ya na ya kparịtara ụka banyere ihe niile nke dị ya nʼobi.
1KI 10:3 Solomọn zara ya ajụjụ ya niile; ọ dịkwaghị ihe siiri eze ike ịkọwara ya.
1KI 10:4 Mgbe eze nwanyị Sheba hụrụ amamihe niile nke Solomọn, hụkwa ụlọeze o wuru,
1KI 10:5 na ihe oriri a na-adọkwasị nʼelu tebul ya, usoro ọnọdụ nke ndịisi ọchịchị ya, na ndị guzo na-ejere ya ozi nʼuwe ha yi, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ ya, na aja nsure ọkụ niile ọ na-achụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, ọ dịkwaghị ihe ọzọ ọ maara ọ ga-eme, maọbụ kwuo.
1KI 10:6 Ọ sịrị eze, “Akụkọ niile m nọ nʼala m nụ banyere ihe niile ị rụpụtara na amamihe gị bụ eziokwu.
1KI 10:7 Ma ekwenyeghị m akụkọ ndị a tutu ruo mgbe m bịara jiri anya m abụọ hụ ha. Nʼezie, ihe m nụrụ erughị ọkara; nʼamamihe nakwa nʼịba ụba gị, ị tụkwasịla ihe nʼakụkọ m nụrụ.
1KI 10:8 Lee, ụdị ọṅụ ndị gị na-enwe. Lee, ụdị ọṅụ nke ndị ozi na-enwe, bụ ndị na-eguzo nʼihu gị mgbe niile na-anụ okwu amamihe gị.
1KI 10:9 Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke gị, onye nwere mmasị nʼebe ị nọ, o debere gị nʼocheeze Izrel. Nʼihi ịhụnanya nke Onyenwe anyị na-adị ruo mgbe ebighị ebi nʼebe Izrel nọ, o meele gị eze, ka ị debe ikpe ziri ezi na ezi omume.”
1KI 10:10 O nyere Solomọn onyinye ọlaedo ịdị arọ ya dị puku kilogram anọ, nyekwa ya ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ dị iche iche, na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa. O nwebeghị oge ọzọ ewebatara ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ dịka ndị ahụ eze nwanyị Sheba nyere eze Solomọn.
1KI 10:11 (Ọzọkwa, ọtụtụ ụgbọ mmiri nke eze Hiram bubatara ọlaedo site nʼỌfịa bulatara Solomọn. Ha sitekwara nʼebe ahụ bute osisi almụg nʼebe ọ bara ụba, na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche.
1KI 10:12 Eze ji osisi almụg ndị a wuo ogidi ndabere dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị na nke ụlọeze. O jikwa ya meere ndị na-abụ abụ ụbọ akwara na une. Ọ dịbeghị mgbe ọbụla ahụrụ maọbụ tụbata osisi almụg ha otu a site nʼụbọchị ahụ ruo taa.)
1KI 10:13 Eze Solomọn nyekwara eze nwanyị Sheba ihe niile ọ chọrọ na ihe niile bụ nke ọ rịọrọ, na-agụnyeghị onyinye niile Solomọn nyere ya dịka eze ọ bụ. Emesịa, ọ hapụrụ laghachi nʼala nke aka ya, ya na ndị na-ejere ya ozi.
1KI 10:14 Ọtụtụ ịdị arọ nke ọlaedo Solomọn na-enweta kwa afọ bụ puku kilogram iri abụọ na atọ,
1KI 10:15 na-agụnyeghị uru nke na-esi nʼaka ndị na-atụ mgbereahịa na ndị na-azụ ahịa na nke sitekwara nʼaka ndị eze Arebịa niile, nakwa nʼaka ndịisi na-achị obodo niile nke ala ahụ.
1KI 10:16 Eze Solomọn kpụrụ narị ọta ọlaedo ukwu abụọ site nʼọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru kilogram isii na ụma itoolu ka eji kpụọ ọta ọbụla.
1KI 10:17 Ọ kpụkwara narị ọta nta atọ, nke sitere na ọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram atọ na ọkara ka eji kpụọ ọta ọbụla. Eze debere ha nʼụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn.
1KI 10:18 Eze mekwara ocheeze dị ukwu nke e ji ọdụ enyi na ọlaedo a nụchara anụcha machie.
1KI 10:19 Ocheeze ahụ nwere ihe nrigo isii, o nwere elu dị gburugburu nʼazụ ya. E nwere ebe ntụkwasị aka nʼakụkụ abụọ ya, nke nwere oyiyi ọdụm abụọ guzo nʼakụkụ nke ọbụla nʼime ha.
1KI 10:20 Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye.
1KI 10:21 Ihe niile Solomọn nwere nke e ji aṅụ ihe bụ ọlaedo ka e ji mee ha. Ngwongwo niile nke dị nʼime ụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji kpụọ ha. Ọ dịghị ihe e ji ọlaọcha kpụọ, nʼihi na-agụnyeghị ọlaọcha dịka ihe ọbụla nʼoge Solomọn.
1KI 10:22 Eze nwere ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa nʼoke osimiri, tinyere ụgbọ nke Hiram. Otu ugbo nʼafọ atọ, ka ụgbọ mmiri ndị a na-alọta, buru ọlaedo, ọlaọcha na ọdụ enyi, enwe na adaka dị iche iche bata.
1KI 10:23 Eze Solomọn bara ụba nʼakụ, nwekwa amamihe karịa ndị eze niile dị nʼụwa.
1KI 10:24 Ụwa niile na-abịa ịchọ ihu Solomọn ka ha nụta okwu amamihe nke Chineke tinyere nʼobi ya.
1KI 10:25 Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ.
1KI 10:26 Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ.
1KI 10:27 Eze mere ka ọlaọcha baa ụba dịka nkume efu na Jerusalem. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche.
1KI 10:28 A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ.
1KI 10:29 Ha sitere nʼIjipt tụbata otu ụgbọ agha nʼọnụ ahịa narị shekel ọlaọcha isii, jirikwa otu narị shekel na iri shekel ise zụta otu ịnyịnya. Ha zipụkwara ha nye ndị eze niile nke ndị Het na ndị Aram.
1KI 11:1 Ma eze Solomọn hụrụ ọtụtụ ndị inyom mba ọzọ nʼanya, tinyere nwa nwanyị Fero, ha bụ ndị inyom ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị Saịdọn na ndị Het.
1KI 11:2 Ha bụ ndị sitere na mba ndị ahụ Onyenwe anyị gwara Izrel sị, “Unu na ha agaghị alụrịtakwa di na nwunye, nʼihi na ha aghaghị ime ka obi unu gbasoo chi niile ha.” Ma, nʼagbanyeghị nke a, Solomọn rapara ha nʼahụ nʼihi ịhụnanya.
1KI 11:3 Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya.
1KI 11:4 Mgbe Solomọn ghọrọ agadi, ndị inyom ndị a duhiere obi ya mee ka ọ gbasoo chi ndị ọzọ, nke mere na o jikwaghị obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka Devid bụ nna ya mere.
1KI 11:5 Ọ gbasoro Ashtọret, bụ chi ndị Saịdọn na Molek, bụ chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.
1KI 11:6 Nʼụzọ dị otu a, Solomọn mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O soghị ụzọ Onyenwe anyị dịka nna ya Devid si mee nʼụbọchị niile nke ndụ ya.
1KI 11:7 Nʼelu ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem, Solomọn wuru ebe dị elu nye Kemosh, chi rụrụ arụ nke ndị Moab, wuokwara Molek chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.
1KI 11:8 O mekwara otu ihe ahụ nye ndị nwunye ya niile si mba ọzọ, bụ ndị na-achụ aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, na-achụkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nye chi niile ha.
1KI 11:9 Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide Solomọn, nʼihi na obi ya esitela nʼebe Onyenwe anyị Chineke Izrel nọ pụọ, bụ onye mere ka ọ hụ ya anya ugboro abụọ.
1KI 11:10 Ọ bụ ezie na o nyere Solomọn iwu ka ọ ghara ịgbaso chi ndị ọzọ, ma Solomọn erubeghị isi nʼiwu a Onyenwe anyị nyere.
1KI 11:11 Ya mere, Onyenwe anyị gwara Solomọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, jụ idebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ m, nke m nyere gị idebe, aghaghị m isite nʼaka gị dọkapụ alaeze a, were ya nye otu nʼime ndị na-ejere gị ozi.
1KI 11:12 Ma nʼihi nna gị Devid agaghị m eme ihe ndị a mgbe ị dị ndụ. Aga m anapụ nwa gị nwoke alaeze Izrel.
1KI 11:13 Ma agaghị m anapụcha ya alaeze Izrel niile, kama aga m eme ka ọ bụrụ eze otu ebo Izrel, nʼihi Devid, na nʼihi Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m.”
1KI 11:14 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mere ka onye iro bilie megide Solomọn. Onye a bụ Hadad onye Edọm, onye sikwa nʼezinaụlọ ndị eze Edọm.
1KI 11:15 Nʼoge gara aga, mgbe Devid na-ebuso ndị Edọm agha, Joab, onyeisi ndị agha, onye gara ili ndị agha e gburu egbu, tigburu ndị ikom niile nọ nʼEdọm.
1KI 11:16 Joab na ndị agha Izrel niile nọgidere nʼebe ahụ ọnwa isii, tutu ruo mgbe ha gbuchapụrụ ndị ikom niile nọ nʼEdọm.
1KI 11:17 Ma Hadad, onye bụ nwantakịrị nʼoge ahụ, gbapụrụ ọsọ gbaga Ijipt, ya na ụfọdụ ndịisi ọchịchị Edọm, ndị jeere nna ya ozi.
1KI 11:18 Ha sitere nʼala Midia gaa Paran. Site na Paran, ha duuru ụfọdụ ndị mmadụ, ndị sooro ha gaa Ijipt, jekwuru Fero eze Ijipt, onye nyere Hadad ụlọ obibi na ala, nyekwa ya ihe oriri.
1KI 11:19 Hadad hụtara amara nʼihu Fero, nke mere na ọ kpọnyere ya nwanne nwanyị Tapenes bụ nwunye eze ka ọ bụrụ nwunye ya.
1KI 11:20 Nwanne Tapenes mụtara ya nwa nwoke aha ya bụ Genubat, onye Tapenes zụlitere nʼụlọeze. Genubat biri nʼetiti ụmụ Fero.
1KI 11:21 Mgbe Hadad nọ nʼIjipt, ọ nụrụ na Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ na Joab ọchịagha ndị agha anwụọkwala, ọ rịọrọ Fero arịrịọ ka o kwenye ka ọ laghachi nʼEdọm.
1KI 11:22 Fero jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji chọọ ịla? O nwere ihe ị chọrọ nke ị na-adịghị enweta nʼebe a?” Hadad zara sị ya, “O nweghị ihe kọrọ m, kama kwere ka m laghachi.”
1KI 11:23 Nwoke ọzọ Chineke mere ka ọ bụrụ onye iro Solomọn bụ Rezon nwa Eliada, onye gbapụrụ site nʼaka nna ya ukwu bụ Hadadeza, eze Zoba.
1KI 11:24 Devid lara ndị agha Zoba nʼiyi, Rezon chịkọtara ndị ikom gbara ya gburugburu, ghọọ onyendu ha, ndị nnupu isi a gara Damaskọs biri nʼebe ahụ, na-achịkwa nʼebe ahụ.
1KI 11:25 Ogologo ụbọchị niile nke ndụ Solomọn, Rezon bụ onye iro Izrel, tinyekwara nsogbu nke Hadad wetaara Izrel. Rezon bụ eze ndị Aram, bụrụkwa onye na-emegide Izrel.
1KI 11:26 Jeroboam nwa Nebat, onye Ifrem nke Zereda, otu nʼime ndị ozi Solomọn, biliri megide eze. Nne ya bụ Zerua, nwanyị di ya nwụrụ anwụ.
1KI 11:27 Nke a bụ akụkọ banyere otu o siri bilie imegide eze: Solomọn wugharịrị Milo, wuziekwa ntipu dị na mgbidi obodo Devid bụ nna ya.
1KI 11:28 Ugbu a Jeroboam, nʼonwe ya, bụ dimkpa. Mgbe Solomọn hụrụ otu nwokorobịa a si arụzi ọrụ ya nke ọma, o mere ya onye nlekọta ndị ọrụ niile si nʼezinaụlọ Josef.
1KI 11:29 Ma otu ụbọchị, mgbe Jeroboam si Jerusalem na-apụ, o zutere Ahija onye amụma, onye Shilo, nʼụzọ, ebe o yi uwe ọhụrụ. Ọ bụkwa naanị ha abụọ nọ nʼọhịa mgbe ahụ.
1KI 11:30 Mgbe ahụ, Ahija yipụrụ uwe ọhụrụ nke o yi nʼahụ dọwasịa ya ụzọ iri na abụọ.
1KI 11:31 Mgbe ahụ, ọ gwara Jeroboam sị, “Chịrị iberibe iri nye onwe gị, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Lee, aga m anapụ Solomọn alaeze a, ma aga m enyekwa gị ebo iri nʼime ha.
1KI 11:32 Ma aga m ahapụrụ ya otu ebo, nʼihi ohu m Devid na nʼihi Jerusalem obodo m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel.
1KI 11:33 Nʼihi na ha ahapụla m malite ịkpọ isiala nye Ashtọret, chi nwanyị ndị Saịdọn; na nyekwa Kemosh, chi ndị Moab; na nye Molek, chi ụmụ Amọn. Ha agbasoghị ụzọ m, ha emekwaghị ihe ndị ahụ m gụrụ dịka ezi ihe. Ha edebeghị iwu m na ụkpụrụ m niile dịka Devid nna Solomọn mere.
1KI 11:34 “ ‘Ma agaghị m anapụ alaeze ya ugbu a, nʼihi ohu m Devid, onye m họpụtara, na onye mere ihe tọrọ m ụtọ. Aga m ahapụ Solomọn ka ọ nọgide dịka eze ụbọchị ndụ ya niile.
1KI 11:35 Ma aga m anapụ alaeze ya site nʼaka nwa ya, nye gị ebo iri.
1KI 11:36 Nwa ya ka m ga-enye otu ebo, nʼihi na achọrọ m ka Devid ohu m nọgide ịbụ eze Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m, ebe m mere ka Aha m dịrị.
1KI 11:37 Ma otu ọ dị, gị ka m ga-ewere. Ị ga-abụkwa onye ga-achị ebe ahụ niile obi gị chọrọ; i ga-abụ eze Izrel.
1KI 11:38 Ọ bụrụ na i gee ntị mee ihe niile m ga-enye gị nʼiwu, jekwa ije nʼirubere m isi, mee ihe ziri ezi nʼanya m, site nʼidebe ụkpụrụ niile na iwu niile, dịka ohu m Devid mere, aga m anọnyere gị. Aga m ewuru gị ụlọ ga-adịgide dịka m siri wuoro Devid. Aga m enyekwa gị Izrel.
1KI 11:39 Aga m eweda agbụrụ Devid nʼihi ihe a, ma ha agaghị abụ ndị e wedara nʼala ruo ebighị ebi.’ ”
1KI 11:40 Solomọn gbalịrị igbu Jeroboam, ma Jeroboam gbaara ọsọ gbakwuru eze Shishak nke Ijipt. Ọ nọkwara nʼIjipt ruo mgbe Solomọn nwụrụ.
1KI 11:41 Ma banyere ihe ndị ọzọ mere nʼoge ọchịchị Solomọn, nke bụ, ihe niile o mere na amamihe o gosipụtara, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Solomọn?
1KI 11:42 Solomọn chịrị Izrel niile iri afọ anọ na Jerusalem.
1KI 11:43 O sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid bụ nna ya. Rehoboam nwa ya, ghọkwara eze nʼọnọdụ nna ya.
1KI 12:1 Rehoboam gara Shekem, nʼihi na Izrel niile zukọrọ ebe ahụ ime ya eze.
1KI 12:2 Mgbe Jeroboam nwa Nebat nụrụ nke a (ọ ka nọ nʼIjipt ebe ọ gbagara ọsọ ndụ site nʼaka eze Solomọn), o sitere Ijipt lọta.
1KI 12:3 Ya mere, ha ziri ozi kpọọ Jeroboam, ya na ọgbakọ Izrel niile jekwuru Rehoboam sị ya:
1KI 12:4 “Nna gị boro anyị ibu arọ, ma ugbu a mee ka ibu arọ na ịyagba arọ a nke o bokwasịrị anyị, dị mfe, anyị ga-ejere gị ozi.”
1KI 12:5 Rehoboam zara ha sị, “Laanụ, ụbọchị atọ gasịa unu bịaghachikwutenụ m.” Nʼihi ya ndị ahụ lara.
1KI 12:6 Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?”
1KI 12:7 Ha zara ya, “Ọ bụrụ na ị ga-abụ odibo nye ndị a taa, jeere ha ozi, nyekwa ha ọsịsa dị mma, ha ga-anọgide bụrụ ndị ohu gị mgbe niile.”
1KI 12:8 Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ.
1KI 12:9 Rehoboam jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ndụmọdụ unu? Gịnị bụ ọsịsa anyị ga-enye ndị a na-asị, ‘Mee ka ibu arọ nna gị bokwasịrị anyị dị mfe’? ”
1KI 12:10 Ụmụ okorobịa ahụ, bụ ndị ya na ha tokọrọ, zaghachiri sị, “Gwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị bokwasịrị anyị ibu arọ, ma mee ka ibu anyị dị mfe,’ ị ga-agwa ha, sị, ‘Mkpịsịaka nta dị nʼaka m gbara okpotokpo karịa ukwu nna m.
1KI 12:11 Nna m boro unu ibu arọ; aga m atụkwasị ihe nʼibu ahụ mee ka ọ dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, maọbụ akpị ka m ga-eji mekpaa unu ahụ.’ ”
1KI 12:12 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jeroboam na ndị Izrel niile bịaghachiri ịnụrụ ọsịsa Rehoboam, dịka eze kwuru, sị, “Laghachitenụ nʼụbọchị nke atọ.”
1KI 12:13 Eze sara ndị a okwu nʼolu dị ike. Ọ jụrụ ndụmọdụ nke ndị okenye nyere ya,
1KI 12:14 ma gbasoro ndụmọdụ nke ụmụ okorobịa nyere. Ọ sịrị, “Nna m mere ka ibu unu dị arọ, aga m eme ka ibu unu dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, aga m eji akpị mekpaa unu ahụ.”
1KI 12:15 Ya mere, eze aṅaghị ndị ahụ ntị, nʼihi mgbanwe nke ọnọdụ niile a sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ, ka e mezuo okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jeroboam nwa Nebat site nʼọnụ Ahija onye Shilo.
1KI 12:16 Mgbe Izrel niile hụrụ na eze jụrụ ige ha ntị, ha zaghachiri ya sị, “Olee oke anyị nwere nʼime Devid? Olee ihe nketa anyị nwere nʼime nwa Jesi? Ndị Izrel, laanụ nʼụlọ ikwu unu! Gị Devid lekọtakwa ụlọ nke gị.” Ya mere, ndị Izrel lara nʼụlọ ha.
1KI 12:17 Ma banyere ndị Izrel bi nʼobodo niile nke Juda, Rehoboam gara nʼihu bụrụ eze ha.
1KI 12:18 Eze Rehoboam zipụrụ Adoniram, onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye, ma ndị Izrel niile ji nkume tugbuo ya. Ma eze Rehoboam jisiri ike gbaba nʼime ụgbọ agha ya, gbalaga laa Jerusalem.
1KI 12:19 Ya mere, Izrel nọ na nnupu isi megide ụlọ Devid ruo taa.
1KI 12:20 Mgbe ndị Izrel nụrụ na Jeroboam alaghachitala, ha ziri ya ozi sị ya pụta nʼihu ọha mmadụ. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee ya eze Izrel. Ọ dịghị ebo ọbụla kwenyere iso ụlọ Devid, karịakwa ebo Juda.
1KI 12:21 Mgbe Rehoboam bịarutere Jerusalem, ọ kpọkọtara ndị ụlọ Juda niile na ndị ebo Benjamin, ha dị narị puku na iri asatọ nʼọnụọgụgụ, ụmụ okorobịa ndị tozuru ịga agha, ka ha gaa buso ụlọ Izrel agha ma weghachitekwa alaeze nʼokpuru ọchịchị Rehoboam, nwa Solomọn.
1KI 12:22 Ma okwu Chineke rutere Shemaya onye nke Chineke ntị, sị,
1KI 12:23 “Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na ndị Juda niile, na Benjamin na ndị ọzọ niile, sị ha,
1KI 12:24 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ụmụnna unu, bụ ndị Izrel agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme nke a.’ ” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu Onyenwe anyị, onye ọbụla nʼime ha laghachikwara nʼụlọ ya dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
1KI 12:25 Mgbe ahụ, Jeroboam wusiri Shekem dị nʼala ugwu Ifrem ike, biri nʼebe ahụ. Nʼebe ahụ ka o si pụọ, gaa wuo obodo Peniel.
1KI 12:26 Ma Jeroboam chere nʼobi ya, sị “Ugbu a, ka alaeze nwere ike laghachikwa nʼaka ụlọ Devid.
1KI 12:27 Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nke dị na Jerusalem, obi ha nwere ike laghachikwuru onyenwe ha, bụ Rehoboam eze Juda. Ha ga-egbu m, laghachikwuru eze Rehoboam.”
1KI 12:28 Mgbe ọ natachara ndụmọdụ, eze kpụrụ ụmụ ehi ọlaedo abụọ. Ọ sịrị ndị mmadụ, “Ọ bụ oke ọrụ nye unu ịgbago Jerusalem. Leenụ chi unu, ndị Izrel, ndị sitere nʼIjipt kpọpụta unu.”
1KI 12:29 Otu nʼime ha ka o guzobere na Betel, tinyekwa nke ọzọ na Dan.
1KI 12:30 Ihe a ghọrọ mmehie dịrị ha, nʼihi na ndị mmadụ na-abịa kpọọ isiala nye nke dị na Betel ma gaakwa ebe dị anya, dịka Dan, nʼihi ife ehi ọlaedo nke dị nʼebe ahụ ofufe.
1KI 12:31 Jeroboam wuru ebe ịchụ aja nʼebe dị elu dị iche iche. Ọ họpụtara ndị nchụaja site nʼetiti ndị Izrel niile, nʼagbanyeghị na ha abụghị ndị Livayị.
1KI 12:32 O hiwere mmemme a na-eme nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke asatọ, dịka mmemme a na-eme na Juda. Ọ chụkwara aja nʼebe ịchụ aja. O mere nke a na Betel, chụọrọ ụmụ ehi ọlaedo ahụ ọ kpụrụ aja. O tinyere ndị nchụaja nʼọrụ nʼebe niile dị elu nke o mere ka ha dịrị na Betel.
1KI 12:33 Nʼụbọchị nke iri na ise, nʼọnwa asatọ, bụ ọnwa nke ya onwe ya chepụtara, ọ chụrụ aja dị iche iche nʼelu ebe ịchụ aja o wuru na Betel. Ya mere, o hiwere mmemme a ka ọ dịịrị ndị Izrel niile; ya onwe ya kwa gara chụọ aja onyinye dị iche iche nʼelu ebe ịchụ aja.
1KI 13:1 Otu onye nke Chineke si Juda bịa Betel, site nʼokwu nke Onyenwe anyị oge Jeroboam guzo nʼebe ịchụ aja ka ọ chụọ aja.
1KI 13:2 O tiri mkpu nʼoke olu megide ebe ịchụ aja ahụ dịka okwu Onyenwe anyị si dị, “Ebe ịchụ aja, ebe ịchụ aja! Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: ‘A ga-amụ otu nwa nwoke nʼụlọ Devid, aha ya ga-abụ Josaya. Ọ ga-eji ndị nchụaja niile nke ebe dị elu, bụ ndị na-achụ aja nʼelu gị, chụọ aja nʼelu gị. A ga-esurekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ ọkụ nʼelu gị.’ ”
1KI 13:3 Nʼụbọchị ahụ, onye nke Chineke ahụ kwuru okwu banyere ihe ịrịbama ga-emezu. O kwuru sị, “Nke a bụ ihe ịrịbama Onyenwe anyị ji emesi okwu ya ike: Ebe ịchụ aja a ga-agbawa ụzọ abụọ. Ntụ dị nʼelu ya ga-awụsasị nʼala.”
1KI 13:4 Mgbe eze Jeroboam nụrụ ihe onye nke Chineke ahụ kwuru megide ebe ịchụ aja Betel, o setịpụrụ aka ya site nʼebe ịchụ aja ahụ sị, “Jidenụ nwoke a!” Ma aka ahụ ọ setịpụrụ tụgide nwoke ahụ kpọnwụrụ na o nwekwaghị ike iweghachi ya azụ ọzọ.
1KI 13:5 Ọzọkwa, ebe ịchụ aja ahụ gbawara abụọ, ntụ dị nʼelu ya wụsịkwara nʼala dịka ihe ịrịbama nke onye amụma Chineke nyere, site nʼokwu Onyenwe anyị.
1KI 13:6 Mgbe ahụ, eze sịrị onye nke Chineke ahụ, “Biko, rịọọ Onyenwe anyị Chineke gị, kpekwara m ekpere ka e nyeghachi m aka m.” Ya mere, onye nke Chineke ahụ rịọrọ Onyenwe anyị site nʼekpere, emekwara ka aka eze dịghachi dịkwa ka ọ dị na mbụ.
1KI 13:7 Emesịa, eze gwara onye nke Chineke ahụ okwu sị, “Soro m gaa nʼụlọ m. Aga m enye gị ihe oriri, nyekwa gị onyinye.”
1KI 13:8 Ma onye nke Chineke ahụ zara eze sị, “Ọ bụrụ na i nye m ọkara ihe niile i nwere, agaghị m eso gị baa nʼime ụlọ gị. Agaghị m erikwa nri gị maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe a.
1KI 13:9 Nʼihi na-enyere m iwu site nʼokwu Onyenwe anyị, sị, ‘Erila nri, aṅụkwala mmiri, esitekwala ụzọ i si gaa laghachi.’ ”
1KI 13:10 Ya mere, o sitere nʼụzọ ọzọ lawa, nke na-abụghị ụzọ o si bịa Betel.
1KI 13:11 Ma o nwere otu onye amụma bụ agadi bi na Betel. Onye ụmụ ya bịara kọọrọ ihe niile onye nke Chineke ahụ mere nʼụbọchị ahụ na Betel, ha kọkwaara nna ha ihe niile ọ gwara eze.
1KI 13:12 Nna ha jụrụ ha, “Olee ụzọ ọ gara?” Ụmụ ya ndị ikom ziri ya ụzọ nke onye nke Chineke ahụ si Juda gara.
1KI 13:13 Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu m.” Ha jikekwaara ya ịnyịnya ibu, ọ nọkwasịrị nʼelu ya.
1KI 13:14 Ọ gbasooro onye nke Chineke nʼazụ, ọ hụrụ ya ka ọ nọ ala nʼokpuru osisi ook, Ọ sịrị ya, “Ọ bụ gị bụ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa?” Ọ zara, “E, ọ bụ mụ onwe m.”
1KI 13:15 Onye amụma ahụ sịrị ya, “Soro m ka anyị gaa nʼụlọ m, ka i rie nri.”
1KI 13:16 Ma ọ sịrị, “Apụghị m iso gị laghachi azụ, maọbụ rie nri, ma ọ bụkwa ṅụọ mmiri ọbụla nʼebe a.
1KI 13:17 Nʼihi na a gwara m site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Erikwala nri maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe ahụ, maọbụ soro ụzọ ị si gaa lọtakwa.’ ”
1KI 13:18 Ma onye nke ọzọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụkwa onye amụma dịka gị, mmụọ ozi zikwara m ozi site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Kpọrọ ya ka o soro gị laghachi nʼụlọ gị, ka o rie nri, ṅụọkwa mmiri.’ ” (Ma ọ gwara ya okwu ụgha.)
1KI 13:19 Ya mere, nwoke nke Chineke ahụ soro ya laghachi rie nri, ṅụọkwa mmiri.
1KI 13:20 Ma mgbe ha abụọ nọdụ na-eri ihe na tebul, okwu Onyenwe anyị rutere onye amụma agadi ahụ ntị, bụ onye mere ka ọ lọghachi azụ.
1KI 13:21 Ọ kpọrọ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na ị nupula isi nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị, hapụ idebe iwu Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị.
1KI 13:22 Ị laghachikwara nʼebe a, rie nri, ṅụọkwa mmiri, bụ ebe ọ gwara gị sị gị, erila nri, aṅụkwala mmiri. Ya mere, agaghị eli ozu gị nʼala ili nna gị ha.’ ”
1KI 13:23 Mgbe onye nke Chineke ahụ risiri nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, ha kwadooro ya ịnyịnya ibu nke onye amụma ahụ kpọghachiri ya azụ.
1KI 13:24 Dịka ọ na-alaghachi, otu ọdụm zutere ya nʼụzọ, dọgbuo ya. Ma ọ hapụrụ ozu ya ka ọ tọgbọrọ nʼokporoụzọ, ma ịnyịnya ibu ya ma ọdụm ahụ dọgburu nwoke ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ya.
1KI 13:25 Ndị mmadụ na-agafe hụrụ ozu ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ, hụkwa ka ọdụm ahụ guzo nʼakụkụ ya. Ndị a gara kọọ akụkọ ihe ha hụrụ nʼụzọ nʼobodo ebe onye amụma agadi ahụ bi.
1KI 13:26 Mgbe onye amụma ahụ mere ka ọ laghachi azụ nụrụ ihe mere, ọ sịrị, “Ọ bụ onye nke Chineke ahụ nupuru isi nʼokwu Onyenwe anyị. Onyenwe anyị enyefeela ya nʼaka ọdụm, nke dọgburu ma gbukwaa ya, dịka okwu Onyenwe anyị dọrọ ya aka na ntị.”
1KI 13:27 Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu.” Ha mere otu a.
1KI 13:28 Ọ pụrụ gaa chọta ozu nwoke ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ. Ịnyịnya ibu ya na ọdụm ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ahụ. Ọdụm erighị anụ nwoke ahụ, ọ dọgbukwaghị ịnyịnya ibu ahụ.
1KI 13:29 Onye amụma agadi ahụ buliri ozu onye nke Chineke ahụ dọkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya bughachi ya nʼobodo, nʼihi iruru ya ụjụ, nakwa ili ya.
1KI 13:30 O liri ozu onye nke Chineke ahụ nʼili nke aka ya. Mgbe o liri ya, ọ kwara akwa sị, “Ewoo nwanna m!”
1KI 13:31 Mgbe o lisiri ya, ọ gwara ụmụ ya ndị ikom sị, “Mgbe m nwụrụ, lienụ m nʼotu ili a e liri onye nke Chineke; doonụ ọkpụkpụ m ka ọ dịrị nʼakụkụ ọkpụkpụ ya.
1KI 13:32 Nʼihi na ozi ahụ niile o ziri site nʼokwu Onyenwe anyị megide ebe ịchụ aja dị na Betel, na megidekwa ebe ụlọ arụsị niile dị nʼebe dị elu nʼobodo Sameria aghaghị imezu.”
1KI 13:33 Nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, Jeroboam esiteghị nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Kama ọ gara nʼihu họpụta ndị nchụaja maka ebe niile dị elu site nʼetiti ndị mmadụ efu. Onye ọbụla chọrọ ị bụ onye nchụaja ka o doro nsọ maka ije ozi nʼebe niile dị elu.
1KI 13:34 Nke a bụ mmehie ezinaụlọ Jeroboam. Ọ bụ ya mere alaeze Jeroboam ji daa, meekwa ka e kpochapụ ya nʼelu ụwa.
1KI 14:1 Nʼoge a, Abija nwa Jeroboam nọ nʼọrịa nke dị ukwuu.
1KI 14:2 Nʼihi ya, Jeroboam sịrị nwunye ya, “Gaa, jikwaa onwe gị nʼụzọ mmadụ na-enweghị ike ịmata na ị bụ nwunye Jeroboam. Ị ga-ejekwa Shaịlo, Ahija onye amụma nọ nʼebe ahụ, bụ nwoke ahụ gwara m okwu na m ga-abụ eze ndị nke a.
1KI 14:3 Chịrịkwa ogbe achịcha iri, na achịcha nta ole na ole, na otu karama mmanụ aṅụ, jekwuru ya. Ọ ga-agwa gị ihe ga-eme banyere nwantakịrị a.”
1KI 14:4 Nwunye Jeroboam mere ihe o kwuru, o biliri jee nʼụlọ Ahija na Shaịlo. Ahija bụ agadi nwoke nʼoge a. Ọ naghị ahụkwa ụzọ nʼihi nka ọ kara.
1KI 14:5 Ma Onyenwe anyị agwalarị Ahija okwu sị ya, “Nwunye Jeroboam na-abịa ịjụta ase nʼaka gị banyere nwa ya nwoke ahụ na-adịghị ike, ọsịsa dị otu a ka i ganye ya. Mgbe ọ ga-abịa ịhụ gị ọ ga-eme onwe ya dịka ọ bụghị nwunye Jeroboam.”
1KI 14:6 Mgbe Ahija nụrụ ụda nzọ ụkwụ ya ka ọ na-abata nʼọnụ ụzọ, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Bata, nwunye Jeroboam. Gịnị mere i ji jie ejiji dịka onye ọzọ? Enwere m akụkọ ọjọọ m ga-akọrọ gị
1KI 14:7 Ga gwa Jeroboam sị ya, Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Esi m nʼetiti ndị m welie gị elu, mee gị ka ị bụrụ onye ga-achị ndị m, bụ Izrel.
1KI 14:8 Adọwapụrụ m alaeze Izrel site nʼụlọ Devid nye gị ya, ma ị geghị ntị nʼiwu m, maọbụ debe ha dịka ohu m Devid debere ihe niile m nyere ya nʼiwu. Onye echiche obi ya na ihe na-atọ obi ya ụtọ mgbe niile bụ idebe iwu m, na ime ihe ziri ezi nʼanya m.
1KI 14:9 Ma ihe ọjọọ i mere adịla ukwuu karịa nke ndị niile bu gị ụzọ bụrụ eze mere. Ị kpụọlara onwe gị chi ndị ọzọ, chi ndị e ji ọla kpụọ, si otu a kpasuo m iwe, gbakụta m azụ gị.
1KI 14:10 “ ‘Nʼihi ihe ndị a, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ezinaụlọ Jeroboam. Aga m ekpochapụkwa ụmụ ndị ikom gị niile, ma ndị ohu, ma ndị nwe onwe ha nọ nʼala Izrel. Aga m ekpochapụkwa ụlọ Jeroboam dịka mmadụ si ekpochapụ nsị anụ, ruo mgbe e kpochapụrụ ha niile.
1KI 14:11 Nkịta ga-eri ozu ndị nke Jeroboam ndị nwụrụ nʼime obodo, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha. Onyenwe anyị ekwuola ya.’
1KI 14:12 “Ma gị onwe gị, Laa nʼụlọ gị. Mgbe ị na-azọbanye ụkwụ gị nʼobodo, nwokorobịa ahụ ga-anwụ.
1KI 14:13 Ndị Izrel niile ga-akwa akwa nʼihi ya lie ya. Ọ bụ naanị ya bụ onye a ga-eli eli, nʼihi na nʼime ezinaụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị nʼime nwokorobịa a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel chọtara ihe dị mma.
1KI 14:14 “Ma Onyenwe anyị ga-emekwa ka eze ọzọ bilie nʼIzrel, onye ga-ekpochapụ ezinaụlọ Jeroboam niile. O bidola taa, e, ma ugbu a kwa!
1KI 14:15 Onyenwe anyị ga-eti Izrel ihe, mee ka ọ maa jijiji dịka osisi achara nke ikuku na-ebugharị nʼime mmiri. Ọ ga-ehopu Izrel site nʼezi ala o nyere nna nna ha, fesaa ha nʼofe osimiri Yufretis, nʼihi na ha akpasuola iwe Onyenwe anyị site nʼiguzobe ogidi ofufe Ashera.
1KI 14:16 Ọ ga-agbakụta Izrel azụ nʼihi mmehie Jeroboam mere, ma meekwa ka Izrel niile soro ya mehie.”
1KI 14:17 Mgbe ahụ, nwunye Jeroboam biliri laghachi Tịaza. Ma nwokorobịa ahụ nwụrụ mgbe ọ na-azọbata ụkwụ ya nʼọnụ ụzọ ụlọ ha.
1KI 14:18 Ha liri ya, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, dịka okwu Onyenwe anyị si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Ahija, onye amụma.
1KI 14:19 Ihe niile ọzọ Jeroboam mere, na ihe niile banyere ibu agha ya niile, na ọtụtụ ihe ọzọ dị iche iche banyere ọchịchị ya, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere.
1KI 14:20 Jeroboam chịrị Izrel iri afọ abụọ na abụọ. O sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, nwa ya Nadab ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
1KI 14:21 Nʼoge a, Rehoboam nwa Solomọn, bụ eze Juda. Ọ gbara iri afọ anọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ Onyenwe anyị họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ọ ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn.
1KI 14:22 Mgbe ahụ, ndị Juda mehiekwara megide Onyenwe anyị. Ha sitere nʼọtụtụ mmehie ha mere, nke karịrị mmehie nke ndị nna nna ha ochie mere, kpasuo ekworo ya.
1KI 14:23 Ha wukwara nye onwe ha ebe ịchụ aja na ogidi arụsị nʼelu ugwu niile, na ogidi chi Ashera, na nʼokpuru osisi ọbụla akwụkwọ ndụ dị nʼelu ya.
1KI 14:24 E nwere ndị ikom akwụna nʼala ahụ, ndị nọ nʼụlọ arụsị ha dị iche iche. Ndị mmadụ mere ụdị ihe arụ ahụ nke ndị mba niile ndị ahụ na-eme, bụ mba ndị ahụ Onyenwe anyị sitere nʼihu ndị Izrel chụpụ.
1KI 14:25 Nʼafọ nke ise, nke ọchịchị eze Rehoboam, Shishak, eze Ijipt, busoro Jerusalem agha.
1KI 14:26 O bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo niile ndị ahụ Solomọn kpụrụ.
1KI 14:27 Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya.
1KI 14:28 Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-ebu ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche.
1KI 14:29 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda?
1KI 14:30 Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha.
1KI 14:31 Rehoboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn. Abija nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
1KI 15:1 Abija malitere ịbụ eze Juda, nʼafọ iri na asatọ nke ọchịchị eze Jeroboam nwa Nebat.
1KI 15:2 Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom.
1KI 15:3 O mere mmehie niile nna ya mere nʼihu ya; o jighị obi zuruoke gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka obi nna nna ya Devid dị.
1KI 15:4 Ma nʼihi Devid, Onyenwe anyị Chineke ya nyere ya oriọna na Jerusalem, site na-ime ka nwa ya nwoke nọchie ọnọdụ ya nakwa ime ka Jerusalem guzosie ike.
1KI 15:5 Nʼihi na Devid mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa iwu Onyenwe anyị ọbụla nke ọ na-edebeghị nʼụbọchị ndụ ya niile, ma ọ bụghị naanị ihe banyere okwu Ụraya, onye Het.
1KI 15:6 Agha dị nʼetiti Abija na Jeroboam nʼụbọchị niile nke ndụ Abija.
1KI 15:7 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Abija, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda? Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam.
1KI 15:8 Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
1KI 15:9 Nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị Jeroboam eze Izrel, ka Asa ghọrọ eze Juda.
1KI 15:10 Ọ chịrị iri afọ anọ na otu na Jerusalem. Aha nne nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom.
1KI 15:11 Asa mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka Devid nna ya mere.
1KI 15:12 O sitere nʼala ahụ niile chụpụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị niile, wezugakwa arụsị niile nke ndị nna nna ya ha mere.
1KI 15:13 Ọ chụdakwara ọbụladị nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn.
1KI 15:14 Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile.
1KI 15:15 O webatara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.
1KI 15:16 Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel ụbọchị ọchịchị ha niile.
1KI 15:17 Baasha eze Izrel, busoro Juda agha, wuchie Rema igbochi onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼoke ala Asa, eze Juda.
1KI 15:18 Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị dị nʼụlọeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ozi ya ka ha chịrị ha zigara Ben-Hadad, nwa Tabrimọm, nwa Hezion, bụ eze Aram, onye na-achị na Damaskọs, sị,
1KI 15:19 “Biko, ka anyị gbaa ndụ dịka nna m na nna gị mere. Lee, ana m ezitere gị onyinye ọlaọcha na ọlaedo. Ugbu a, mebie ọgbụgba ndụ dị nʼetiti gị na Baasha, bụ eze Izrel, ka o si nʼebe m nọ wezuga onwe ya.”
1KI 15:20 Ben-Hadad kwenyere eze Asa, zipụ ndị ọchịagha ndị agha ya ka ha gaa buso obodo Izrel niile agha. Ọ lụgburu Ijon, Dan, Ebel-Bet-Maaka na ala Kineret niile, tinyere ala niile nke ndị Naftalị.
1KI 15:21 Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, laghachi biri na Tịaza.
1KI 15:22 Mgbe ahụ, eze Asa nyere iwu zigara ndị Juda niile, na ọ dịghị onye iwu ahụ hapụrụ, ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe nʼebe ahụ. Eze Asa ji ihe ndị a wulie Geba nke Benjamin, wuokwa Mizpa.
1KI 15:23 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Asa, na ihe niile ọ rụpụtara na obodo niile ndị o wuru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Juda? Ma ọ rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ, mgbe o mere agadi.
1KI 15:24 Asa sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ nna ya. Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
1KI 15:25 Nadab, nwa Jeroboam, malitere ịbụ eze Izrel, nʼafọ nke abụọ nke Asa, eze Juda. Ọ chịrị Izrel afọ abụọ.
1KI 15:26 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ niile nke nna ya ma na-emekwa otu mmehie ahụ nke nna ya ji duba Izrel nʼime mmehie.
1KI 15:27 Baasha nwa Ahija, onye si nʼebo Isaka gbara izu ọjọọ megide ya. O tidara ya na Gibeton, nʼotu obodo ndị Filistia, mgbe Nadab na ndị Izrel niile nọchibidoro ya.
1KI 15:28 Baasha gburu Nadab, nọchie ọnọdụ ya dịka eze, nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Asa, eze Juda.
1KI 15:29 Ngwangwa, mgbe ọ malitere ọchịchị ya, o gburu ndị ezinaụlọ Jeroboam niile. O kweghị ka onye ọbụla na-eku ume fọdụ, kama ọ lara ha niile nʼiyi, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onyeozi ya, bụ Ahija onye Shilo.
1KI 15:30 Ihe ndị a mere nʼihi mmehie niile Jeroboam mere, nke o mere ka Izrel mee, nakwa nʼihi na ọ kpasuru Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel iwe.
1KI 15:31 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Nadab, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel?
1KI 15:32 Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel, ụbọchị ọchịchị ha niile.
1KI 15:33 Nʼafọ nke atọ nke Asa, eze Juda, Baasha nwa Ahija ghọrọ eze ndị Izrel niile na Tịaza. Ọ chịrị iri afọ abụọ na abụọ.
1KI 15:34 O mere ọtụtụ ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam, jeekwa ije nʼime otu mmehie ahụ nke Jeroboam dubara ndị Izrel ime.
1KI 16:1 Mgbe ahụ, ozi Onyenwe anyị sitere nʼọnụ Jehu, nwa Hanani banyere Baasha, eze Izrel sị ya,
1KI 16:2 “Esi m nʼaja welie gị elu, mee gị onye ọchịchị ndị m Izrel. Ma i jeela ije nʼụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam. I meela ka ndị m bụ Izrel mmehie, si otu a kpasuo m iwe site na mmehie ha.
1KI 16:3 Ya mere, aga m ekpochapụ Baasha na ezinaụlọ ya, m ga-emekwa ụlọ gị ka ọ dịka ụlọ Jeroboam, nwa Nebat.
1KI 16:4 Onye ọbụla nke metụtara Baasha nke nwụrụ nʼime obodo ka nkịta ga-eri ozu ya, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha.”
1KI 16:5 Akụkọ niile banyere ọrụ Baasha rụrụ, na ibu agha ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọrụ ndị eze Izrel?
1KI 16:6 Baasha sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Tịaza. Ela, nwa ya nwoke, nọchiri ọnọdụ ya dịka eze.
1KI 16:7 Ma ozi Onyenwe anyị si nʼọnụ Jehu onye amụma, nwa Hanani bịara Baasha na ndị ezinaụlọ ya nʼihi ihe ọjọọ niile o mere, si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe. Ọ bụ ezie na ọ maara na Onyenwe anyị kpochapụrụ ezinaụlọ Jeroboam nʼihi ihe ọjọọ o mere, ma Baasha gara nʼihu mee ihe ọjọọ.
1KI 16:8 Ela, nwa Baasha, malitere ịbụ eze Izrel nʼiri afọ abụọ na isii nke ịbụ eze Asa, eze Juda. Ma naanị afọ abụọ ka ọ chịrị dịka eze na Tịaza.
1KI 16:9 Mgbe ahụ, Zimri, ọchịagha na-achị ọkara ụgbọala agha eze, gbara izuzu megide ya. Nʼoge a, Ela nọ na-aṅụ mmanya na Tịaza, nʼụlọ Aza, onye na-elekọta ụlọeze dị nʼobodo ahụ. Ọ ṅụkwara mmanya ahụ ṅụbiga ya oke.
1KI 16:10 Zimri batara kụdaa ma gbukwaa ya. Ọ bụ nʼiri afọ abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda. Ọ bụụrụ eze nʼọnọdụ ya.
1KI 16:11 Ngwangwa ọ ghọrọ eze, nọkwasị nʼocheeze ya, o gburu mmadụ niile nọ nʼezinaụlọ Baasha. Ọ hapụghị ọ bụladị otu nwoke. O gburu ikwu na ibe Baasha, na ndị enyi ya niile.
1KI 16:12 Ya mere, Zimri kpochapụrụ ndị ezinaụlọ niile Baasha, nʼusoro okwu Onyenwe anyị kwuru megide Baasha site nʼọnụ onye amụma ya bụ Jehu.
1KI 16:13 Nʼihi mmehie niile nke Baasha na nwa ya Ela mere, na nke ha ji mee ka Izrel mehie, bịakwa kpasuo iwe Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel, site nʼarụsị ha niile na-abaghị uru.
1KI 16:14 Akụkọ banyere ọchịchị Ela, na ihe niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ ọchịchị ndị eze Izrel?
1KI 16:15 Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda, ka Zimri chịrị ụbọchị asaa na Tịaza. Nʼoge a, ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu na Gibeton, obodo ndị Filistia na-ebu agha.
1KI 16:16 Mgbe ha nụrụ na Zimri egbuola eze ha, ha niile kwekọtara mee Omri eze ọhụrụ ha. Omri bụ onyeisi agha ndị agha Izrel niile.
1KI 16:17 Nʼihi nke a, Omri duuru ndị agha ahụ nọ na Gibeton bịa ibuso Tịaza, isi obodo Izrel agha.
1KI 16:18 Mgbe Zimri hụrụ na-adọtala obodo ahụ nʼagha, ọ banyere nʼụlọ elu dị nʼụlọeze, sunye onwe ya na ụlọeze ahụ ọkụ. O si otu a nwụọ,
1KI 16:19 nʼihi na Zimri nʼonwe ya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jeroboam. Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dubakwa ụmụ Izrel nʼime mmehie.
1KI 16:20 Akụkọ banyere Zimri na ihe ọjọọ niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel?
1KI 16:21 Ma nʼoge a, ndị Izrel kere onwe ha ụzọ abụọ maka onye ga-abụ eze ha. Otu ụzọ dịnyeere Omri, ndị nke ọzọ dịnyeere Tibni, nwa Ginat.
1KI 16:22 Ma ndị dịnyeere Omri dị ike karịa ndị dịnyeere Tibni, nwa Ginat. Ya mere, Tibni nwụrụ. Omri ghọkwara eze Izrel.
1KI 16:23 Asa, eze Juda anọọla iri afọ atọ na otu dịka eze mgbe Omri malitere ịbụ eze Izrel. Omri chịrị Izrel afọ iri na abụọ, afọ isii nʼime afọ ndị a na Tịaza.
1KI 16:24 Omri zụrụ ala ugwu ugwu a na-akpọ Sameria site nʼaka Shema, kwụọ ya talenti ọlaọcha abụọ. O wuru obodo ọhụrụ nʼugwu ahụ gụọ aha ya Sameria, nʼihi na aha onyenwe ala ahụ na mbụ bụ Shema.
1KI 16:25 Ma Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze Izrel niile buru ya ụzọ.
1KI 16:26 Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dịka Jeroboam nwa Nebat mere. O dubakwara ndị Izrel nʼime mmehie. Nʼihi nke a o mere ka iwe wee Onyenwe anyị, Chineke Izrel, nʼihi arụsị nzuzu ha.
1KI 16:27 Akụkọ ihe niile Omri mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel?
1KI 16:28 Omri sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Ehab, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
1KI 16:29 Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Asa na Juda, ka Ehab, nwa Omri, malitere ịchị dịka eze nʼIzrel. Ọ chịrị ndị Izrel iri afọ abụọ na abụọ na Sameria.
1KI 16:30 Ehab nwa Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze niile buru ya ụzọ.
1KI 16:31 Ọ bụghị naanị na ọ gụrụ mmehie niile Jeroboam nwa Nebat mere dị ka ihe dị nta, kama ọ gara nʼihu lụọ Jezebel, nwa nwanyị Etbaal, eze ndị Saịdọn. O bidokwara ịkpọ isiala nye arụsị Baal, na ife ya ofufe.
1KI 16:32 O guzobere ebe ịchụ aja nye Baal, nʼụlọ arụsị Baal nke o wuru na Sameria.
1KI 16:33 Ehab manyere ogidi chi Ashera, si otu a kpasuo Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel iwe karịa otu ndị eze Izrel niile bu ya ụzọ chịa si mee.
1KI 16:34 Mgbe Ehab na-achị, ka Hiel, onye Betel, wughachiri obodo Jeriko. Ọkpara ya bụ Abiram nwụrụ, mgbe ọ tọrọ ntọala obodo ahụ, ka ọ guzobere ọnụ ụzọ ama ya ọtọ, nwa ya nwoke nke nta aha ya bụ Segub nwụrụ, imezu okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Joshua nwa Nun.
1KI 17:1 Ugbu a, Ịlaịja onye Tishbe, onye si obodo Tishbe, nke dị nʼala Gilead, sịrị Ehab, “Eji m aha Onyenwe anyị Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe na onye m na-ejere ozi na-agwa gị na igirigi agaghị ada, mmiri agaghị ezo ọzọ nʼafọ ndị a na-abịa karịa ma ọ bụghị naanị site nʼokwu ọnụ m!”
1KI 17:2 Okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja ntị, sị ya,
1KI 17:3 “Si nʼebe a pụọ. Soro ụzọ ọwụwa anyanwụ, gaa zoo onwe gị nʼakụkụ iyi Kerit, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ya, nke bụ nʼihu Jọdan.
1KI 17:4 Nọdụ nʼebe ahụ ṅụọ mmiri si nʼiyi ahụ, riekwa nri ọbụla ụmụ ugolọma ga-ebutere gị, nʼihi na enyela m ha iwu ka ha nye gị nri.”
1KI 17:5 O mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọ gara nʼakụkụ iyi nta Kerit nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan nọrọ nʼebe ahụ.
1KI 17:6 Ugolọma na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na anyasị niile. Ọ na-aṅụkwa mmiri site nʼiyi ahụ.
1KI 17:7 Ma mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, mmiri ahụ tara, nʼihi na mmiri adịghị ezokwa nʼala ahụ.
1KI 17:8 Okwu Onyenwe anyị bịakwutere ya,
1KI 17:9 “Bilie, jee Zarefat, obodo dị Saịdọn nso, biri nʼebe ahụ. O nwere otu nwanyị di ya nwụrụ, onye m nyere iwu ka o nye gị nri.”
1KI 17:10 Ịlaịja biliri jee Zarefat. Mgbe o ruru ọnụ ụzọ ama e si abanye obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ nọ na-achịkọta nkụ. Ịlaịja kpọrọ ya oku sị ya, “Biko, kutere m ntakịrị mmiri nʼiko ka m ṅụọ.”
1KI 17:11 Mgbe nwanyị ahụ na-aga ikute mmiri ahụ, Ịlaịja kpọrọ ya oku ọzọ sị ya, “Biko, wetara m otu iberibe achịcha ka m taa.”
1KI 17:12 Ma nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke na-adị ndụ, enweghị m achịcha ọbụla nʼụlọ m. Naanị ihe m nwere bụ otu njuaka ụtụ ọka dị nʼite, na mmanụ ntakịrị dị na karama. Ugbu a, ana m achịkọta nkụ ka m baa ga siere onwe m siekwara nwa m nri, ka anyị rie, chere ọnwụ ga-abịa egburu anyị.”
1KI 17:13 Ịlaịja sịrị ya, “Atụla egwu! Gaa mee dịka i kwuru. Ma naanị buru ụzọ meere m ogbe achịcha ntakịrị site nʼihe i nwere, wetara m ya. Emesịa, mee nke gị na nwa gị ga-eri.
1KI 17:14 Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Ụtụ ọka dị nʼite ahụ agaghị agwụ, mmanụ ahụ dị nʼite ahụ agakwaghị akọ tutu ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị ga-ezite mmiri ozuzo nʼala a.’ ”
1KI 17:15 Nwanyị ahụ mere dịka Ịlaịja kwuru. Sitekwa nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ihe oriri akọkwaghị Ịlaịja na nwanyị ahụ, na ezinaụlọ ya.
1KI 17:16 Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma.
1KI 17:17 Mgbe ihe ndị a gasịrị, nwa nwanyị ahụ nwe ụlọ rịara ọrịa. Ọrịa a bịara sie ike nke ukwuu na ume afọdụghị nʼime ya.
1KI 17:18 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ kwaara akwa bịakwute Ịlaịja sị ya, “Ewoo, onye nke Chineke, gịnị ka i nwere megide m? Ị bịara ka i chetara m mmehie m, na igbu nwa m nwoke?”
1KI 17:19 Ịlaịja zara sị ya, “Kunye m nwa gị nwoke.” Ịlaịja kuuru ya site nʼaka nne ya rigoo nʼụlọ elu ebe ya onwe ya na-edina, nibe ya nʼelu ihe ndina ya.
1KI 17:20 Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Onyenwe anyị Chineke m, gịnị mere i ji wetara nwanyị a m bi nʼụlọ ya ihe mgbu site nʼikwe ka nwa nwoke ya nwụọ?”
1KI 17:21 Ịlaịja gbatịrị onwe ya nʼahụ nwantakịrị ahụ ugboro atọ, kpọkuo Onyenwe anyị, sị, “Biko, Onyenwe anyị Chineke m, kwere ka mkpụrụobi nwantakịrị a laghachikwute ya.”
1KI 17:22 Onyenwe anyị nụrụ ekpere Ịlaịja, ndụ nwantakịrị ahụ laghachikwutere ya, ọ dịkwara ndụ ọzọ.
1KI 17:23 Mgbe ahụ, Ịlaịja kuuru ya si nʼụlọ elu ahụ rịdata, kunye ya nne ya, gwa ya okwu sị, “Lee, nwa gị dị ndụ!”
1KI 17:24 Nwanyị ahụ sịrị Ịlaịja, “Ugbu a, amatala m na ị bụ onye nke chineke, na okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ gị apụta bụ eziokwu.”
1KI 18:1 Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nʼafọ nke atọ, okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja ntị, “Bilie, gaa gosi Ehab onwe gị. Aga m emekwa ka mmiri zookwa nʼala a.”
1KI 18:2 Ya mere, Ịlaịja pụrụ gaa igosi Ehab onwe ya. Ma ụnwụ dị na Sameria nʼoge a siri nnọọ ike.
1KI 18:3 O nwere otu nwoke na-elekọta ihe dị nʼezinaụlọ Ehab. Aha ya bụ Ọbadaya. (Ọ bụ nwoke ji obi ya niile kwere na Onyenwe anyị.
1KI 18:4 Mgbe eze nwanyị bụ Jezebel na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị chọọ igbuchapụ ha, ọ bụ Ọbadaya zoro narị ndị amụma nʼime ha nʼime ọgba nkume. O zoro iri ndị amụma ise nʼotu ọgba nkume, zookwa iri ndị amụma ise fọdụrụ nʼime ọgba nkume ọzọ. Emesịa, ọ na-ewegara ha nri na mmiri nʼebe ahụ.)
1KI 18:5 Ehab kpọrọ Ọbadaya sị ya, “Jegharịa nʼala a niile nyochapụta na ndagwurugwu na isi iyi niile, ebe ahịhịa ndụ dị. Gbutere ịnyịnya na ịnyịnya muul m ahịhịa ahụ ka ha taa ghara ịnwụ, ka anyị gharakwa igbu ha.”
1KI 18:6 Ha kere ala ahụ nʼetiti onwe ha. Ehab sitere otu akụkụ, ma Ọbadaya sitere akụkụ nke ọzọ.
1KI 18:7 Ọ dịghị anya, na mberede, Ọbadaya hụrụ Ịlaịja ka ọ na-abịa izute ya. Ọbadaya matara na ọ bụ ya. Nʼihi ya, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala sị, “Ọ bụ gị ka m hụrụ nʼezie, onyenwe m, Ịlaịja?”
1KI 18:8 Ịlaịja zara sị ya, “E, ọ bụ m. Ugbu a gaa gwa onyenwe gị, ‘mụ bụ Ịlaịja nọ nʼebe a.’ ”
1KI 18:9 Mgbe ahụ, Ọbadaya jụrụ Ịlaịja sị, “Gịnị bụ ihe m mejọrọ, nke mere i ji na-achọ inyefe ohu gị nʼaka Ehab ka o gbuo ya?
1KI 18:10 Dịka Onyenwe anyị Chineke gị sị adị ndụ, o nwebeghị mba maọbụ alaeze dị nke nna m ukwu na-ezigaghị mmadụ ịchọ gị. Ebe ọbụla ọ gara a na-akọrọ ya na Ịlaịja anọghị nʼebe ahụ. Ehab na-eme ka eze obodo ahụ ṅụọ iyi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.
1KI 18:11 Ma ugbu a, ị na-asị m gaa gwa Onyenwe m na, ‘Ịlaịja nọ nʼebe a.’
1KI 18:12 Ọ bụrụkwanụ na m esite nʼebe a pụọ, onye ma ebe Mmụọ Onyenwe anyị ga-ebuga gị. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na Ehab abịa hapụ ịhụ gị, ọ ga-egbu m. Nʼihi na mụ bụ ohu gị bụ onye na-efe Onyenwe anyị ofufe siterị na mgbe m bụ okorobịa.
1KI 18:13 Ọ bụ na onyenwe m anụghị ihe m mere mgbe Jezebel nọ na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị? E zoro narị ndị amụma Onyenwe anyị nʼime ọgba nkume abụọ, iri ise nʼime otu ọgba nkume, iri ise nʼime otu ọgba nkume ka m zoro ha, jirikwa nri na mmiri ọṅụṅụ zụọ ha.
1KI 18:14 Ma ugbu a i na-agwa m sị m, ‘Gaa gwa onyenwe gị na Ịlaịja abịala.’ Ọ ga-egbukwa m!”
1KI 18:15 Ma Ịlaịja zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, onye m na-ejere ozi, ana m agwa gị na agaghị m esi nʼebe a pụọ tutu ruo mgbe m gosiri Ehab onwe m taa.”
1KI 18:16 Mgbe ahụ, Ọbadaya pụrụ gaa kọọrọ Ehab na Ịlaịja abịala. Emesịa, Ehab pụtara izute Ịlaịja.
1KI 18:17 Mgbe ọ hụrụ Ịlaịja, Ehab sịrị ya, “Ọ bụ gị onwe gị bụ nke a, gị onye na-emekpa Izrel ahụ?”
1KI 18:18 Ịlaịja zara sị Ehab, “O nweghị mgbe m ji butere Izrel nsogbu. Ọ bụ gị onwe gị na ezinaụlọ nna gị na-ebutere Izrel nsogbu. Unu agbakụtala iwu Onyenwe anyị azụ, gbasoro chi Baal dị iche iche.
1KI 18:19 Ugbu a, kpọkọta ndị Izrel niile ka ha zute m nʼugwu Kamel. Kpọpụtakwa ndị amụma Baal ọnụọgụgụ ha dị narị anọ na iri mmadụ ise, na ndị amụma Ashera, ndị dị narị anọ, bụ ndị na-eso eze nwanyị Jezebel erikọ ihe na tebul ya.”
1KI 18:20 Ehab zigara ozi kpọkọta ndị Izrel niile, na ndị amụma ahụ niile. Ha niile bịakwara nʼugwu Kamel.
1KI 18:21 Ịlaịja gara nʼihu ndị a, sị ha, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka unu ga-akwụsị inwe obi abụọ? Ọ bụrụ na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, soronụ ya! Ma ọ bụrụkwanụ na unu ekpebie na Baal bụ chi unu, soronụ ya.” Ma ndị zukọrọ nʼebe ahụ ekwughị ihe ọbụla.
1KI 18:22 Mgbe ahụ Ịlaịja sịrị ha, “Leenụ! Ọ bụ mụ onwe m, naanị m, bụ onye amụma Onyenwe anyị fọdụrụ, ma ndị amụma Baal dị narị anọ na iri ise nʼọnụọgụgụ.
1KI 18:23 Ugbu a wetanụ oke ehi abụọ ka ndị amụma Baal họrọ otu oke ehi, nke ha chọrọ. Ha ga-egbujasị ya, tụkwasị ya nʼelu nkụ dị nʼebe ịchụ aja, ma ha agaghị amụnye ọkụ ọbụla nʼokpuru ya. Mụ onwe m ga-akwado oke ehi nke ọzọ tụkwasị ya nʼelu nkụ ma agaghị m amụnyekwa ọkụ nʼokpuru ya.
1KI 18:24 Emesịa, unu ga-akpọku chi Baal unu, mụ onwe m kwa ga-akpọku aha Onyenwe anyị. Ọ ga-erukwa na chi ga-eji ọkụ za, chi ahụ bụ Chineke.” Ndị Izrel niile zara sị, “Okwu gị dị mma.”
1KI 18:25 Ịlaịja gwara ndị amụma Baal, sị, “Ebe unu dị ọtụtụ, burunu ụzọ họrọ otu oke ehi nʼime ehi abụọ a dozie ya. Unu amụnyekwala ya ọkụ nʼokpuru, kama kpọkuonụ chi unu.”
1KI 18:26 Ya mere, ndị amụma Baal weere oke ehi ahụ e nyere ha doziekwa ya. Mgbe ahụ, ha kpọkuru aha Baal, chi ha. Site nʼụtụtụ tigide mkpu ruo nʼetiti ehihie na-asị “O Baal, biko, zaa anyị.” Ma o nweghị ihe ha nụrụ site nʼọnụ Baal. Ọ dịkwaghị onye zara ha. Ha malitere ite egwu gburugburu ebe ịchụ aja ahụ ha kwadoro.
1KI 18:27 Nʼihe dị ka nʼetiti ehihie, Ịlaịja malitere ịchị ha ọchị, na ịkwa ha emo. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Tisienụ mkpu ike ka Baal nwe ike ịnụ arịrịọ unu. Nʼezie, ọ bụ chi! Ma eleghị anya ọ nọ nʼoke echiche, maọbụ o ji ọrụ nʼaka, maọbụ ọ gara njem. Ma eleghị anya ọ na-arahụ ụra. Ọ chọrọ onye ga-akpọte ya.”
1KI 18:28 Ndị amụma a tiri mkpu nʼoke olu dịka ha si eme. Ha ji mma na ùbe na-egbukasị onwe ha ahụ, tutu ruo mgbe ọbara malitere isite ha nʼahụ na-agbapụta.
1KI 18:29 Ma mgbe etiti ehihie gasịrị, ha nọgidekwara na-ebu amụma ruo mgbe oge ịchụ aja uhuruchi ruru, ma o nweghị onye zara ha, o nwekwaghị olu a nụrụ. Ọ dịkwaghị onye ṅara ha ntị.
1KI 18:30 Mgbe ahụ, Ịlaịja kpọrọ ndị Izrel sị ha, “Bịaruenụ m nso.” Ha niile bịaruru ya nso, o doziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, bụ ndị ahụ a kwaturu nʼala na mbụ.
1KI 18:31 Ịlaịja chịịrị nkume iri na abụọ, nke otu nʼime ha nọchiri anya otu ebo Jekọb, onye okwu Onyenwe anyị rutere si ya, “Aha gị ga-abụ Izrel.”
1KI 18:32 O ji nkume ndị a wuzie ebe ịchụ aja Onyenwe anyị. Emesịa, o gwuru olulu miri emi, nke gbara ebe ịchụ aja ahụ gburugburu.
1KI 18:33 Ọ tụkwasịrị nkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, tụkwasịkwa otu oke ehi o gbujasịrị nʼelu nkụ ndị ahụ. Emesịa, o nyere ndị nọ nʼebe ahụ iwu sị ha, “Gbajuonụ ite anọ mmiri. Butekwanụ mmiri ahụ bịa wụkwasị ya nʼelu aja nsure ọkụ a, na nʼelu nkụ ndị a.” Mgbe ha mesiri nke a, Ịlaịja gwara ha okwu sị,
1KI 18:34 “Gbajukwaanụ ite mmiri ndị ahụ, bute ha bịa wụkwasị mmiri ahụ nke ugboro abụọ nʼelu aja nsure ọkụ a.” Ha mere dịka Ịlaịja kwuru. Ịlaịja nyekwara ha iwu sị, “Gbajukwaanụ ya nke ugboro atọ, bịa wụkwasị ya.” Ha mekwara otu a.
1KI 18:35 Mmiri jupụtakwara nʼebe ịchụ aja ahụ, na olulu ahụ dị ya gburugburu.
1KI 18:36 Mgbe oge e ji achụ aja anyasị ruru, Ịlaịja, onye amụma bịara ebe ịchụ aja ahụ nso kpee ekpere sị, “O, Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Izrel, biko gosi taa na ọ bụ gị onwe gị bụ naanị Chineke nʼIzrel, na mụ onwe m bụkwa ohu gị. Gosikwa na m bụ onyeozi gị, na ọ bụ ihe i nyere m nʼiwu ka m mere oge ndị a niile.
1KI 18:37 Biko, Onyenwe anyị m, zaa m ekpere m, zaa m ya, ka ndị Izrel niile mata na gị onwe gị, Onyenwe anyị bụ Chineke, na gị onwe gị na-atụgharịkwa obi ha ịlaghachikwute gị.”
1KI 18:38 Mgbe ahụ, na mberede, ọkụ Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe daa, rechapụ oke ehi ahụ, na nkụ ahụ, na nkume, na ntụ, ma rechapụkwa mmiri niile dị nʼime olulu ahụ dị gburugburu ebe ịchụ aja ahụ.
1KI 18:39 Mgbe ndị mmadụ ahụ niile hụrụ ihe a mere, ha niile dara nʼala kpuo ihu nʼala, na-eti mkpu na-asị, “Onyenwe anyị, ya onwe ya bụ Chineke! Onyenwe anyị ya onwe ya bụ Chineke!”
1KI 18:40 Mgbe ahụ, Ịlaịja nyere ha iwu sị, “Jidenụ ndị amụma Baal niile. Unu ekwekwala ka otu onye nʼime ha laa.” Ha jidekwara ha niile. Ịlaịja dukwaara ha niile gaa na ndagwurugwu iyi Kishọn, gbuo ha nʼebe ahụ.
1KI 18:41 Emesịa, Ịlaịja gwara Ehab okwu sị, “Gaa rie nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ; nʼihi na anụrụ m ụzụ oke mmiri ozuzo ka ọ na-ada.”
1KI 18:42 Nʼihi nke a, Ehab sitere nʼebe ahụ pụọ gaa iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma Ịlaịja rigooro nʼelu ugwu Kamel gbuo ikpere nʼala, kpuokwa ihu ya nʼala nʼetiti ikpere ya abụọ ikpe ekpere.
1KI 18:43 Nʼoge a, ọ gwara nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Gaa lee anya nʼụzọ oke osimiri.” Ọ rịgoro lee anya, sị, “Ọ dịghị ihe ọbụla m hụrụ.” Ịlaịja gwakwara ya otu a, ugboro asaa, sị ya, “Jeghachi.”
1KI 18:44 O ruo na nke ugboro asaa, nwokorobịa ahụ bịaghachiri sị Ịlaịja, “Onyenwe m, ahụrụ m igwe ojii dị nta dịka ọbụ aka mmadụ ka o si nʼoke osimiri na-apụta.” Ya mere, Ịlaịja sịrị, “Gaa gwa Ehab, ‘dozie ụgbọ agha gị, gbadaa tupu mmiri ozuzo egbochi gị ịla.’ ”
1KI 18:45 Ọ dịghị anya, eluigwe gbajikọtara nnọọ oji. Oke ifufe bidokwara ife. Mmiri dị ukwuu bidokwara izo. Mgbe ahụ, Ehab gbaara ụgbọ agha ya laa Jezril.
1KI 18:46 Ma ike Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaịja. Ọ fanyere ọnụ uwe mwụda ya na belịt o kere nʼukwu, gbapụ ọsọ buru Ehab ụzọ gbaruo obodo Jezril.
1KI 19:1 Ehab kọọrọ Jezebel ihe niile Ịlaịja mere, na otu o si jiri mma agha gbuo ndị amụma Baal niile.
1KI 19:2 Nʼihi nke a, Jezebel zigara onyeozi ka ọ ga zie Ịlaịja sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso, nʼagbanyeghị otu mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na oge dịka oge a echi, egbughị gị dịka i si gbuo ndị amụma Baal.”
1KI 19:3 Ịlaịja tụrụ egwu, gbapụ ọsọ, nʼihi ichebe ndụ ya. Mgbe ọ bịaruru Bịasheba, dị na Juda, ọ hapụrụ nwokorobịa na-ejere ya ozi nʼebe ahụ.
1KI 19:4 Ma ya onwe ya pụkwara jee ije otu ụbọchị nʼọzara naanị ya. Nʼikpeazụ, ọ kwụsịrị nọdụ ala nʼokpuru otu osisi brum, kpee ekpere rịọọ ka a napụ ya ndụ ya. Ekpere o kpere nʼoge a bụ, “O zuorela m Onyenwe anyị, biko napụ ndụ m. O nweghị ụzọ m si dị mma karịa nna nna m ha.”
1KI 19:5 O dinara nʼokpuru osisi brum rahụ ụra. Ma lee, otu oge ahụ, mmụọ ozi metụrụ ya aka, sị ya, “Bilie, rie nri.”
1KI 19:6 Ịlaịja biliri legharịa anya, hụ ogbe achịcha na ite mmiri nta nke dị nʼakụkụ ebe ọ tụkwasịrị isi ya. O riri ogbe achịcha ahụ a hụrụ nʼicheku ọkụ, ṅụọkwa mmiri ahụ. Emesịa, o dinakwara ọzọ.
1KI 19:7 Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị bịaghachikwara nke ugboro abụọ, sị ya, “Bilie rie ihe, nʼihi na ije dị gị nʼihu dị ukwuu.”
1KI 19:8 Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb nke bụ ugwu Chineke.
1KI 19:9 Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼotu ọgba nkume rahụ ụra abalị nʼime ya. Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”
1KI 19:10 Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a, ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.”
1KI 19:11 Onyenwe anyị sịrị ya, “Pụọ gaa guzo nʼelu ugwu, nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị na-aga isite nʼebe ahụ gafee.” Mgbe ahụ, oke ifufe dị ike gbawara ugwu ahụ, tipịasịa nkume ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ifufe ahụ. Mgbe ifufe ahụ gasịrị, e nwere oke ala ọma jijiji nʼugwu ahụ, ma Onyenwe anyị anọkwaghị nʼala ọma jijiji ahụ.
1KI 19:12 Mgbe ala ọma jijiji ahụ gasịrị, ọkụ nwuuru, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ọkụ ahụ. Ma mgbe ọkụ ahụ gasịrị, nwa olu nta dị nwayọọ dara.
1KI 19:13 Mgbe Ịlaịja nụrụ ya, o ji uwe mwụda ya kpuchie ihu ya, pụọ gaa guzo nʼọnụ ụzọ ọgba nkume ahụ. Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu jụrụ ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”
1KI 19:14 Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.”
1KI 19:15 Onyenwe anyị sịrị ya, “Sikwa ụzọ i si bịa laghachi, gaa nʼọzara Damaskọs. Mgbe i ruru ebe ahụ, tee Hazael mmanụ ịbụ eze Aram.
1KI 19:16 Teekwa Jehu, nwa Nimshi mmanụ ịbụ eze Izrel. Ị ga-etekwa Ịlaisha nwa Shafat, onye Ebel-Mehola mmanụ ịbụ onye amụma nʼọnọdụ gị.
1KI 19:17 Onye ọbụla gbanarịrị Hazael ga-anwụ nʼaka Jehu. Otu a kwa, ndị niile gbanarịrị mma agha Jehu ka Ịlaisha ga-egbu.
1KI 19:18 Ma ghọta na ọ dị puku mmadụ asaa nọ nʼIzrel, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal, maọbụ sutu ya ọnụ, ife ya ofufe.”
1KI 19:19 Ịlaịja sitere nʼebe ahụ pụọ gaa chọta Ịlaisha nwa Shafat ebe ọ nọ na-akọ ala ubi. Iri ehi abụọ na anọ e jikọtara abụọ abụọ dị ya nʼihu, ma ya onwe ya ji ehi abụọ e jikọtara ọnụ, nke iri na abụọ ya na-akọ ala ubi. Ịlaịja jekwuru Ịlaisha wụkwasị ya uwe mwụda ya nʼubu ya.
1KI 19:20 Mgbe ahụ, Ịlaisha hapụrụ ehi ndị ahụ ebe ha guzoro nʼubi ahụ gbara ọsọ gbakwuru Ịlaịja sị ya, “Biko, kwere ka m gaa sutu nna m na nne m ọnụ, sị ha nọdụ nke ọma. Emesịa, aga m esokwa gị.” Ịlaịja zara sị ya, “Laghachi azụ, ọ bụ gịnị ka m mere gị?”
1KI 19:21 Ịlaisha laghachiri azụ, gbuo ehi abụọ ahụ e jikọtara nʼotu, kpọọ ihe ahụ e ji arụ ọrụ nʼubi ọkụ, were ha sie anụ ahụ nye ndị mmadụ, ha rie. Mgbe ahụ, o biliri ije pụọ ga soro Ịlaịja, bụrụ nwaodibo ya.
1KI 20:1 Ugbu a, Ben-Hadad, bụ eze ndị Aram, chịkọtara ndị agha ya niile. Iri ndị eze atọ na abụọ sonyere ya, ha na ịnyịnya ha na ụgbọ agha ha. Ọ rịgooro nọchibido obodo Sameria buso ya agha.
1KI 20:2 Mgbe ahụ, eze ndị Siria zigaara Ehab, eze Izrel ozi nʼime obodo sị ya, “otu a ka Ben-Hadad sịrị,
1KI 20:3 ‘Ọlaọcha na ọlaedo gị, nkem ka ha bụ, ndị nwunye gị na ụmụ gị, bụ ndị dị mma karịsịa nke m ka ha bụ.’ ”
1KI 20:4 Ehab eze Izrel, zighachiri ozi sị, “Ọ dị mma, onyenwe m, mụ onwe m, na ihe niile m nwere bụ nke gị.”
1KI 20:5 Ngwangwa ndị ozi Ben-Hadad bịaghachiri zie Ehab ozi ọzọ sị ya, “Otu a ka Ben-Hadad sịrị, ‘Ọ bụ ezie na m ziteere gị ozi, sị, ọlaọcha gị na ọlaedo gị na ndị nwunye gị na ụmụ gị ka ị ga-enye m.
1KI 20:6 Ma ugbu a, nʼoge dị ka nke a, echi, aga m ezite ndị ozi m ka ha bịa nyochaa ụlọ gị niile na ụlọ ndị ozi gị niile. Ihe ọbụla dị oke ọnụahịa nʼanya gị ka ha ga-ewere.’ ”
1KI 20:7 Eze Izrel kpọrọ ndị okenye niile nke ala ahụ, sị ha, “Leenụ ugbu a, hụkwanụ otu nwoke a si achọ nsogbu. Mgbe o zitere m ozi inye ya ndị nwunye m, na ụmụ, na ọlaọcha m na ọlaedo m, ekwenyere m ya inye ya ihe ndị a.”
1KI 20:8 Ndị okenye na ndị Izrel zara sị ya, “Aṅala ya ntị! Enyela ya ihe ọbụla.”
1KI 20:9 Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị ozi Ben-Hadad, “Gwanụ onyenwe m, bụ eze, ‘M bụ odibo gị jikeere ime ihe niile ị buru ụzọ kwuo na m ga-enye gị. Ma ekwenyeghị m nʼozi nke ugboro abụọ a.’ ” Ndị ozi ahụ laghachiri kọọrọ Ben-Hadad ihe niile Ehab kwuru.
1KI 20:10 Ma Ben-Hadad zigakwaara Ehab ozi ọzọ sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na aja Sameria ga-afọdụ inye onye ọbụla nʼetiti ndị ikom m otu njuaka.”
1KI 20:11 Ma eze Izrel zaghachiri, “Gwa ya, ‘Onye na-ebu agha na-anya isi naanị mgbe a lụchara agha, ọ bụghị tupu a lụọ agha.’ ”
1KI 20:12 Ben-Hadad nụrụ ozi Ehab ziri mgbe ya na ndị eze ndị ọzọ ahụ nọ na-aṅụ mmanya nʼụlọ ikwu ha manyere nʼọgbọ agha ahụ. Ben-Hadad nyere ndị agha ya iwu sị ha, “Jikerenụ, buso ndị Izrel agha.” Ya mere, ha kwadoro ibuso obodo ahụ agha.
1KI 20:13 Nʼoge a, otu onye amụma bịakwutere Ehab, bụ eze Izrel sị, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị hụrụ oke igwe ndị agha a? Aga m enyefe ha nʼaka gị taa, mgbe ahụ ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
1KI 20:14 Ma Ehab jụrụ sị, “Onye ga-eme nke a?” Onye amụma zara, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụ ụmụ okorobịa bụ ndịisi agha nọ nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị akụkụ ala Izrel.’ ” Ehab jụkwara ọzọ, “Onye ga-amalite agha a?” Onye amụma ahụ zara, “Gị onwe gị.”
1KI 20:15 Mgbe ahụ, Ehab kpọkọtara ụmụ okorobịa bụ ndịisi agha si nʼakụkụ obodo ya. Ọnụọgụgụ ha dị narị abụọ na iri atọ na mmadụ abụọ. Ọnụọgụgụ ndị agha Izrel ndị ọzọ dị puku asaa.
1KI 20:16 Nʼetiti ehihie, mgbe Ben-Hadad na iri ndị eze atọ na abụọ ahụ, bụ ndị ahụ bịara inyere ya aka nọ na-aṅụ mmanya, na-aṅụbiga ya oke,
1KI 20:17 ụmụ okorobịa, bụ ndị agha, ndị nọ nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị akụkụ ala Izrel buru ụzọ pụọ ibu agha. Ma Ben-Hadad, nʼonwe ya ezipụlarị ndị nledo, ndị lọghachiri bịa gwa ya sị, “Ndị agha si Sameria na-abịa.”
1KI 20:18 Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ha abịa nʼihi udo, jidenụ ha na ndụ; ọ bụrụ na ha bịara maka ibu agha, jidenụ ha na ndụ!”
1KI 20:19 Ma ụmụ okorobịa ndị ọchịchị a bụ ndị nọ nʼokpuru ndịisi, na-achị akụkụ ala ahụ sitere nʼobodo zọlie ije ebe ndị agha so ha nʼazụ, pụọ ibu agha.
1KI 20:20 Onye ọbụla nʼime ha gburu onye agha Siria ọbụla lụsoro ya ọgụ. Nke a mere ka ndị agha Siria gbapụ ọsọ, ndị agha Izrel chụsokwara ha. Ma Ben-Hadad, eze Aram, na ndị agha na-agba ịnyịnya, sitekwara nʼihu ọgbọ agha ahụ gbapụkwa ọsọ.
1KI 20:21 Ma eze ndị Izrel pụkwuru ya, nwude ọtụtụ ịnyịnya na ụgbọ agha, butere ndị Aram ọghọm dị ukwuu.
1KI 20:22 Emesịa, onye amụma ahụ bịakwutere eze Izrel sị ya, “Mee onwe gị ka ị dị ike nke ọma, mara ihe e kwesiri ka e mee, nʼihi nʼetiti ọkọchị na udu mmiri nke afọ nʼabịa, eze Aram ga-abịa ibuso gị agha ọzọ.”
1KI 20:23 Ma otu ọ dị, ndịisi agha eze ndị Aram dụrụ ya ọdụ sị, “Chi ha bụ chi ugwu. Nʼihi ya ka ha ji dị ike karịa anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ebuso ha agha nʼobosara ala dị larịị, anyị aghaghị ịdị ike karịa ha.
1KI 20:24 Mee ihe a, wepụ ndị eze a niile site nʼebe ha nọ, jiri ndị na-achị ala gbanwee ha.
1KI 20:25 Kpọkọtaakwa ndị agha ọzọ, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka ndị agha i du gaa agha na mbụ. Nyekwa anyị ịnyịnya na ụgbọ agha ga-ezuru anyị. Anyị ga-apụkwa buso ndị Izrel agha nʼobosara ala dị larịị. Ọ dịkwaghị ihe ga-egbochi anyị imeri ha nʼoge a.” Ben-Hadad, eze Aram, kwenyere, meere ha dịka ha rịọrọ ya.
1KI 20:26 Mgbe otu afọ gasịrị, Ben-Hadad chịkọtakwara ndị Aram niile duru ha gaa Afek ibuso Izrel agha.
1KI 20:27 Mgbe a kpọkọtara ndị agha niile nọ nʼIzrel nye ha ngwa agha, ha pụrụ izute ha. Ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha na ncherita ihu ndị agha Siria, dịka igwe ewu nta abụọ, ebe ndị Aram jupụtara ala ahụ niile.
1KI 20:28 Onye nke Chineke bịara gwa eze ndị Izrel, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Nʼihi na ndị Aram na-eche na Onyenwe anyị bụ chi nke ugwu, na ọ bụghị chi ala ndagwurugwu, aga m arara igwe ndị agha a nyefee gị nʼaka, ka gị na ndị gị mata nʼeziokwu na m bụ Onyenwe anyị.’ ”
1KI 20:29 Ọ bụ ụbọchị asaa ka ha mara ụlọ ikwu ha na ncherita ihu ibe ha. Ma nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị agha malitere ibu agha. Ndị Izrel merụrụ narị puku ndị agha Aram ahụ nʼotu ụbọchị.
1KI 20:30 Ma ndị fọdụrụ nʼetiti ndị agha Aram gbapụrụ ọsọ gbalaga nʼobodo Afek. Ebe ahụ ka mgbidi obodo Afek nọ dagbuo iri puku ndị agha abụọ na asaa nʼime ha. Ma Ben-Hadad nʼonwe ya gbalagara, gbaba nʼime obodo ahụ, gaa zoo onwe ya nʼime ime otu ụlọ.
1KI 20:31 Mgbe ahụ, ndịisi agha ya bịakwutere ya sị ya, “Lee, anyị nụrụ na ndị eze Izrel bụ ndị obi ebere. Ka anyị yiri akwa mkpe nʼukwu anyị, kee ụdọ nʼolu anyị, gaa rịọọ eze Izrel. Ma eleghị anya ọ ga-edebe gị ndụ.”
1KI 20:32 Ya mere, ha yikwasịrị onwe ha akwa mkpe, nyarakwa ụdọ nʼolu ha, jekwuru eze Izrel sị ya, “Ohu gị bụ Ben-Hadad na-asị, ‘Biko, kwee ka m dịrị ndụ.’ ” Eze jụrụ ha sị, “Ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ ugbu a? Nwanne m ka ọ bụ.”
1KI 20:33 Okwu a mere ka ndị ozi eze Aram nwee olileanya. Ha mere ngwangwa kwugharịakwa ihe ahụ o kwuru. Ha sịrị, “E, Nwanne gị bụ Ben-Hadad.” Mgbe ahụ, eze Ehab nyere ha iwu sị, “Gaanụ kpọpụta ya, dutekwanụ ya nʼebe a.” Mgbe Ben-Hadad bịara, Ehab mere ka ọ rigota nʼụgbọ agha nke ya.
1KI 20:34 Mgbe ahụ, Ben-Hadad gwara Ehab sị, “Obodo niile nke nna m naara nna gị, ka m ga-enyeghachi gị. I nwere ike iwuru onwe gị ọdụ ahịa nʼama obodo Damaskọs dịka nna m wuru nʼime Sameria.” Ehab kwuru, “Ọ bụrụ na anyị agbaa ndụ, aga m eme ka i nwere onwe gị.” Ya mere, ha abụọ gbara ndụ. Ehab hapụkwara ya ka ọ laa nʼudo.
1KI 20:35 Emesịa, okwu Onyenwe anyị rutere otu onye nʼetiti ụmụ ndị amụma. Ọ gwara otu nwoke nʼime ụmụ ndị amụma ahụ nọ ya nso sị ya, “Jiri ngwa agha dị gị nʼaka tie m ihe.” Ma nwoke ahụ jụrụ ime ihe onye amụma ahụ kwuru.
1KI 20:36 Nʼihi nke a, onye amụma gwara nwoke ahụ okwu sị, “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ime ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, lee ihe ga-adakwasị gị. Mgbe i si nʼebe a na-ala nʼụlọ gị, ọdụm ga-ezute gị nʼụzọ dọgbuo gị.” Amụma a mezukwara, nʼihi na mgbe nwoke ahụ tụgharịrị si nʼebe ahụ na-ala, ọdụm lụsoro ya ọgụ nʼụzọ gbuo ya.
1KI 20:37 Onye amụma ahụ pụkwara chọta onye ọzọ sị ya, “Biko, tie m ihe.” Nwoke ahụ tiri ya ihe tihịa ya ahụ.
1KI 20:38 Mgbe ahụ, onye amụma ahụ e tiri ihe jiri akwa kechie ihu ya, ka mmadụ ọbụla ghara ịmata onye ọ bụ. Ọ pụrụ gaa guzo nʼakụkụ ụzọ ebe eze Izrel ga-esi gafee.
1KI 20:39 Mgbe eze na-agafe, onye amụma ahụ tiri mkpu sị, “Onyenwe m, biko gee m ntị. Lee, otu onye agha bịakwutere m mgbe m nọ nʼihu agha sị m, ‘Lee nwoke a a dọtara nʼagha; chee ya nche. Ekwekwala ka ọ gbanarị gị. Nʼihi na ọ bụrụ na o site nʼaka gị gbapụ, ị ga-anwụ, maọbụ i jiri otu talenti ọlaọcha gbara isi gị.’
1KI 20:40 Ma mgbe m nọ na-arụ ọrụ ọzọ, nwoke ahụ a dọtara nʼagha gbapụrụ. Ahụkwaghị m ya anya ọzọ.” Mgbe ahụ, eze Izrel zara sị ya, “I jirila ọnụ gị maa onwe gị ikpe. Ị ghaghị ịnata ahụhụ dịrị gị.”
1KI 20:41 Mgbe ahụ, onye amụma ahụ mere ngwangwa wepụ akwa ahụ o ji kechie anya ya abụọ. Eze Izrel matakwara na ọ bụ otu onye nʼime ndị amụma.
1KI 20:42 Onye amụma ahụ gwara eze okwu sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ebe i mere ka nwoke a laa, bụ onye m nyere gị nʼaka ime ka ọ nwụọ, ugbu a, ị ghaghị ịnwụ nʼọnọdụ ya. A ga-alakwa ndị gị nʼiyi, nʼọnọdụ ndị nke ya.’ ”
1KI 20:43 Nʼihi okwu a, eze Izrel ji iwe na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya dị na Sameria.
1KI 21:1 Mgbe nwa oge nta gasịrị, Nebọt, onye Jezril, nwere ubi vaịnị dị na Jezril, nʼakụkụ ụlọeze Ehab bụ eze Sameria.
1KI 21:2 Ehab sịrị Nebọt, “Nye m ubi vaịnị gị ka ọ bụrụ ubi a gbara ogige, ebe m ga-akụ akwụkwọ nri, ebe ọ dị nso nʼụlọeze m. Aga m enye gị ubi vaịnị ọzọ dị mma karịa ya, ma ọ bụrụkwa na ị chọrọ, aga m akwụ gị ego ọbụla o ruru nʼọnụ ahịa ya.”
1KI 21:3 Ma Nebọt zara sị Ehab, “Ala a bụ ihe nketa ruuru m site nʼaka nna nna m ha. M ga-esi aṅaa nye gị ya. Onyenwe anyị ekwela na m ga-ewere ihe nketa nke nna nna m ha nye gị.”
1KI 21:4 Ehab jiri obi ụfụ na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya nʼihi okwu a Nebọt, onye Jezril gwara ya, sị, “Agaghị m enye gị ihe nketa nna nna m ha.” O dinara nʼihe ndina ya, chee ihu ya nʼaja ụlọ, jụ iri ihe ọbụla.
1KI 21:5 Ma nwunye ya bụ Jezebel, bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji jụ iri ihe? Gịnị mere i ji nọgide nʼobi ọjọọ na iwe?”
1KI 21:6 Ehab zara sị ya, “Agwara m Nebọt, nwoke onye Jezril okwu sị ya, ‘Resi m ubi vaịnị gị, ma ọ bụrụ na ị chọrọ, aga m enye gị ala ubi ọzọ mara mma nʼọnọdụ ya.’ Ma ọ jụrụ jụwaa isi inye m ubi ahụ.”
1KI 21:7 Mgbe ahụ, nwunye ya Jezebel jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Ọ bụghị gị bụ eze na-achị Izrel? Bilie, rie nri, enyela obi gị nsogbu, nʼihi na aga m enyefe gị ubi vaịnị Nebọt onye Jezril nʼaka.”
1KI 21:8 Ya mere, Jezebel dere akwụkwọ nʼaha Ehab, were mgbaaka akara eze kaa nʼakwụkwọ ndị ahụ, zigara ha ndị okenye obodo na ndị a na-asọpụrụ bi nʼobodo ebe Nebọt bi.
1KI 21:9 Nʼime akwụkwọ ozi ndị a, o dere sị, “Nyenụ iwu ka mmadụ niile buo ọnụ. Kpọkọtaanụ ndị Jezril niile, ka ha zukọta. Mgbe unu zukọrọ, nyenụ Nebọt ọnọdụ nʼoche dị mkpa.
1KI 21:10 Họpụtanụ ndị ikom abụọ, ndị na-abaghị uru ka ha pụta nʼihu nzukọ unu guzo gbaa ama ụgha megide Nebọt sị na ha nụrụ mgbe ọ kọchara Chineke na eze. Maanụ ya ikpe ọnwụ, kpụpụ ya nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya, ka ọ nwụọ.”
1KI 21:11 Ndị okenye na ndị a na-asọpụrụ ndị bi nʼobodo ahụ mere dịka Jezebel nyere nʼiwu nʼakwụkwọ ahụ o degaara ha.
1KI 21:12 Ha nyere iwu maka ibu ọnụ, kpọọkwa nzukọ ndị obodo ahụ niile, meekwa ka Nebọt nọdụ nʼoche dị mkpa.
1KI 21:13 Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ na-abaghị uru pụtakwara, nọdụ na ncherita ihu ya, ha gbara ama ụgha megide Nebọt, nʼihu ndị mmadụ, sị, “Nebọt kọchara Chineke na eze.” Nʼihi nke a, ha dọkpụụrụ ya gaa nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya.
1KI 21:14 Emesịa, ndị okenye na ndị a maara aha ha nke obodo Jezril, ziri ozi zigara Jezebel gwa ya na Nebọt anwụọla.
1KI 21:15 Ngwangwa Jezebel natara ozi na a tụgbola Nebọt, ọ sịrị Ehab, “Bilie, gaa nwetara onwe gị ubi vaịnị Nebọt, nwoke onye Jezril. Ubi ahụ ọ jụrụ inye gị nʼego abụrụla nke gị ugbu a nʼihi na Nebọt anwụọla. Ọ dịkwaghị ndụ ọzọ!”
1KI 21:16 Mgbe Ehab nụrụ na Nebọt anwụọla, o biliri pụọ, gaa ịbanye nʼubi ahụ, inwetara onwe ya ubi vaịnị Nebọt, onye Jezril.
1KI 21:17 Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe, sị ya,
1KI 21:18 “Bilie, gaa zute Ehab, eze Izrel onye bi na Sameria. Ọ nọ ugbu a nʼime ubi vaịnị Nebọt inwetara ya onwe ya.
1KI 21:19 Gwa ya sị ya, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: I gbuola ọchụ mmadụ si otu a nwetara onwe gị ihe nketa? Ebe ahụ nkịta nọ rachaa ọbara Nebọt ka ha ga-anọ rachaakwa ọbara gị. E, ọbara gị onwe gị.’ ”
1KI 21:20 Mgbe ahụ, Ehab jụrụ Ịlaịja ajụjụ sị ya, “Onye iro m, ị chọrọkwala m bịa?” Ịlaịja zara sị ya, “E, achọrọla m gị bịa nʼihi nnyefe i nyefere onwe gị ime ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
1KI 21:21 Ọ sịrị, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ dakwasị gị. Aga m ekpochapụ ndị agbụrụ gị, site nʼezinaụlọ Ehab bipụ nwoke ọbụla, maọbụ ohu maọbụ onyenwe onwe ya nʼIzrel.
1KI 21:22 Aga m eme ka ụlọ gị dịrị ka nke Jeroboam nwa Nebat, na dịka nke Baasha nwa Ahija, nʼihi na ị kpasuola m iwe, meekwa ka Izrel mehie.’
1KI 21:23 “Ma banyere Jezebel, Onyenwe anyị sịrị, ‘Ụmụ nkịta ga-eri anụ ahụ Jezebel nʼakụkụ mgbidi aja ụlọ dị nʼobodo Jezril.’
1KI 21:24 “Nkịta ga-eri anụ onye ọbụla si nʼezinaụlọ Ehab nke nwụrụ nʼime obodo, ma anụ ufe nke eluigwe ga-eri anụ ndị ọbụla nwụrụ nʼọhịa.”
1KI 21:25 (Nʼezie, o nweghị onye ọbụla ọzọ dị ka Ehab, onye rere onwe ya nye ime ihe ọjọọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, onye Jezebel nwunye ya kwagidere ime ihe ọjọọ dị iche iche.
1KI 21:26 Ehab bụ onye mere mmehie dị oke njọ nke ịgbaso na ife arụsị dị iche iche ofufe dịka ndị Amọrait mere, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị sitere nʼala a chụpụ ime ka ndị Izrel nweta ala ha.)
1KI 21:27 Mgbe Ehab nụrụ okwu amụma ndị a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, buo ọnụ, dinaa nʼakwa mkpe ahụ, jegharịakwa nʼịdị umeala.
1KI 21:28 Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe ọzọ, sị ya,
1KI 21:29 “Ị hụrụ otu Ehab si weda onwe ya ala nʼihu m? Nʼihi ihe a o mere, iweda onwe ya ala nʼihu m, agaghị m eme ka ihe ọjọọ ndị a m kwuru okwu banyere ha rute ya nʼoge ọ dị ndụ. Kama aga m eme ka ihe ndị a dakwasị ezinaụlọ ya mgbe nwa ya ga-achị dịka eze.”
1KI 22:1 Agha ọzọ adaghị nʼetiti Aram na Izrel afọ atọ.
1KI 22:2 Ma nʼafọ nke atọ, Jehoshafat, eze Juda, gara ileta Ehab eze Izrel.
1KI 22:3 Eze Izrel sịrị ndị ozi ya, “Unu amaghị na ala Ramọt Gilead bụ nke anyị, ma lee na anyị gbara nkịtị ịga napụta ya site nʼaka eze Aram?”
1KI 22:4 Ya mere, ọ jụrụ Jehoshafat, “Ị ga-eso m gaa buso Ramọt Gilead agha?” Jehoshafat zaghachiri eze Izrel, sị, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị m bụkwa ndị gị, ịnyịnya m bụkwa nke gị.”
1KI 22:5 Ma Jehoshafat gwakwara eze Izrel, sị, “Buru ụzọ chọpụta ihe bụ ntụziaka Onyenwe anyị.”
1KI 22:6 Ya mere, eze Izrel kpọkọtara ndị amụma, ọnụọgụgụ ha ruru narị ndị ikom anọ, jụọ ha sị, “Ọ bụ m gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ ịga?” Ha zara, “Gaa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ha nʼaka eze.”
1KI 22:7 Ma Jehoshafat jụrụ, “Ọ bụ na e nwekwaghị onye amụma Onyenwe anyị nọ nʼebe a, onye anyị nwere ike ịjụta ase nʼaka ya?”
1KI 22:8 Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ Onyenwe anyị ase, ọ bụ Maikaya nwa Imla, ma akpọrọ m ya asị, nʼihi na o nweghị oge ọ na-ebu amụma ihe ọma nʼebe m nọ, kama ọ bụ naanị nke ọjọọ.” Jehoshafat sịrị, “Eze ekwesighị ikwu okwu dị otu a.”
1KI 22:9 Mgbe ahụ, eze Izrel kpọrọ otu onye na-ejere ya ozi sị ya, “Mee ọsịịsọ kpọta Maikaya nwa Imla nʼebe a.”
1KI 22:10 Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha.
1KI 22:11 Zedekaya nwa Kenaana, mere mpi igwe, ọ kwupụtara sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Ihe ndị a ka ị ga-eji sọgide ndị Aram, ruo mgbe a ga-ala ha nʼiyi.’ ”
1KI 22:12 Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.”
1KI 22:13 Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.”
1KI 22:14 Ma Maikaya sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Onyenwe anyị gwara m.”
1KI 22:15 Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ anyị hapụ?” Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.”
1KI 22:16 Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha Onyenwe anyị?”
1KI 22:17 Mgbe ahụ Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ, ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Ndị a enweghị onyendu. Ka onye ọbụla laghachi nʼụlọ ya nʼudo.’ ”
1KI 22:18 Eze Izrel, sịrị Jehoshafat, “Ọ bụ na m agwaghị gị na ọ dịghị mgbe ọ na-ebu amụma ihe ọma banyere m, kama naanị ihe ọjọọ?”
1KI 22:19 Mikaya gara nʼihu, sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị. Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼakụkụ ya, nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya.
1KI 22:20 Onyenwe anyị sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’ “Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ.
1KI 22:21 Nʼikpeazụ otu mmụọ pụtara, guzo nʼihu Onyenwe anyị sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’
1KI 22:22 “ ‘Onyenwe anyị jụrụ sị, Olee otu ị ga-esi mee nke a?’ “ ‘Aga m apụ gaa bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile,’ ka ọ zara. “Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’
1KI 22:23 “Ma ugbu a, Onyenwe anyị etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. Onyenwe anyị ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.”
1KI 22:24 Mgbe ahụ, Zedekaya nwa Kenaana, gara nso, maa Maikaya aka na nti, jụọ ya, “Olee ụzọ ka mmụọ ahụ sitere na Onyenwe anyị gara, mgbe ọ hapụrụ m bịa ịgwa gị okwu?”
1KI 22:25 Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.”
1KI 22:26 Mgbe ahụ, eze Izrel nyere iwu sị, “Jidenụ Maikaya kpụgara ya Amọn onye na-achị obodo a, na Joash nwa eze
1KI 22:27 ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’ ”
1KI 22:28 Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị Onyenwe anyị si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama!”
1KI 22:29 Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, pụrụ gawa Ramọt Gilead.
1KI 22:30 Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha.
1KI 22:31 Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha ndị na-agba ụgbọ agha, ọnụọgụgụ ha dị iri atọ na abụọ, iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.”
1KI 22:32 Mgbe ndị ọchịagha, na-achị ụgbọ agha hụrụ Jehoshafat, ha chere nʼobi ha, “Nʼezie, onye a bụ eze Izrel.” Nʼihi ya ha tụgharịrị ibuso ya agha, ma Jehoshafat tiri mkpu,
1KI 22:33 ndị ọchịagha, na-achị ndị na-agba ụgbọ agha hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ma kwụsị ịchụso ya.
1KI 22:34 Ma otu onye dọrọ ụta ya gbapụ ya na-ebughị onye ọbụla nʼobi, gbata ya eze Izrel nʼetiti njikọ nke uwe agha ya. Eze gwara onye ọkwọ ụgbọ agha ya, sị, “Tụgharịa, si nʼebe a bupụ m, nʼihi na emerụọla m ahụ.”
1KI 22:35 Agha ahụ siri ike nʼụbọchị ahụ niile, e ji ihe mee ka eze kwụrụ ọtọ nʼime ụgbọ agha ya na-eche ndị Aram ihu. Ọbara si nʼọnya ahụ sọjuru nʼala ụgbọ agha ahụ, ọ nwụrụ nʼuhuruchi ụbọchị ahụ.
1KI 22:36 Mgbe anyanwụ na-ada, e tiri mkpu nke gazuru nʼọgbọ agha ndị Izrel, sị, “Nwoke ọbụla laa nʼobodo ya, onye ọbụla laakwa nʼala nke aka ya!”
1KI 22:37 Ya mere, eze nwụrụ, e buta ozu ya nʼobodo Sameria, ebe a nọ lie ya.
1KI 22:38 Ha sachara ụgbọ agha ya nʼọdọ mmiri dị na Sameria (ebe ndị akwụna na-asa ahụ). Ụmụ nkịta rachara ọbara ya, dịka okwu Onyenwe anyị kwubiri.
1KI 22:39 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ehab na ihe niile o mere, ụlọeze o wuru nke o ji ọdụ chọọ mma, na obodo niile o wusiri ike, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel?
1KI 22:40 Ehab sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Ahazaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ.
1KI 22:41 Jehoshafat nwa Asa ghọrọ eze Juda, nʼafọ nke anọ, nke ọchịchị Ehab eze Izrel.
1KI 22:42 Jehoshafat gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi.
1KI 22:43 Nʼihe niile o jere ije nʼụzọ Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ niile.
1KI 22:44 Jehoshafat mere ka udo dị nʼetiti ya na eze Izrel.
1KI 22:45 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Jehoshafat, ihe niile ndị ọ rụpụtara, ike ọ kpara nʼọtụtụ agha nke o buru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
1KI 22:46 O kpochapụrụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị, bụ ndị nke fọdụrụ, mgbe nna ya bụ Asa chịchara ọchịchị.
1KI 22:47 Nʼoge a, eze adịghị nʼala Edọm, kama ọ bụ onye nnọchite anya eze bụ onye na-achị.
1KI 22:48 Jehoshafat wuuru ọtụtụ ụgbọ mmiri eji azụ ahịa, maka ije nʼala Ọfịa ịga bute ọlaedo ma ụgbọ mmiri ndị a agaghị ebe ọbụla, nʼihi na ha mikpuru nʼEziọn Geba.
1KI 22:49 Nʼoge ahụ, Ahazaya nwa Ehab sịrị Jehoshafat, “Kwere ka ndị ikom m soro ndị ọrụ gị nʼụgbọ gị,” ma Jehoshafat ekweghị.
1KI 22:50 Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid, nna ya. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
1KI 22:51 Ahazaya nwa Ehab, malitere ịbụ eze Izrel na Sameria, nʼafọ iri na asaa nke ọchịchị Jehoshafat, eze Juda. Ma ọ chịrị Izrel naanị afọ abụọ.
1KI 22:52 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na o sooro ụzọ ọjọọ niile nke nna na nne ya, na ụzọ ọjọọ nke Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel mee mmehie.
1KI 22:53 Ọ fekwara arụsị Baal ofufe, kpọọkwa isiala nye ya, si otu a kpasuo Onyenwe anyị, Chineke Izrel iwe, dịka nna ya mere.
2KI 1:1 Moab nupuru isi megide Izrel mgbe Ehab nwụrụ.
2KI 1:2 Nʼoge a, Ahazaya sitere na mgbe ụlọ elu ya dị na Sameria daa, merụọ ahụ nke ukwuu. Nʼihi ọrịa a, o zigara ndị ozi, sị ha, “Gaa jụta ase nʼaka Baal-Zebub, bụ chi Ekrọn, ma m ga-adịrị site nʼihe mmerụ ahụ a.”
2KI 1:3 Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja onye Tishbe okwu sị ya, “Gaa zute ndị ozi eze Sameria zipụrụ, jụọ ha sị, ‘Gịnị mere unu ji aga Ekrọn ịjụ ase? Ọ bụ na Chineke anọghị nʼIzrel mere unu ji aga ịjụ Baal-Zebub ase ịmata ma eze ọ ga-adị ndụ?’
2KI 1:4 Nʼihi nke a, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ị gaghị esite nʼelu ihe ndina ahụ bilie. Ị ghaghị ịnwụ!’ ” Ya mere Ịlaịja pụrụ gaa zie ndị ozi eze ozi ahụ.
2KI 1:5 Ndị ozi ahụ laghachiri azụ. Ma mgbe eze hụrụ ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọghachi?”
2KI 1:6 Ha zara ya, “Otu nwoke zutere anyị nʼụzọ sị anyị, ‘Laghachi ga zie eze ahụ zitere unu sị ya: “Ihe ndị a, ka Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ nʼihi na Chineke anọghị nʼIzrel ka i ji zipụ ndị mmadụ ka ha gaa jụta ase site nʼaka Baal-Zebub, chi ndị Ekrọn? Nʼihi nke a, ị gaghị esite nʼihe ndina gị bilie. Ya doo gị anya na ị ghaghị ịnwụ!” ’ ”
2KI 1:7 Eze jụrụ ha sị, “Onye bụ nwoke a zutere unu nʼụzọ gwa unu okwu ndị a? Olee ụdị mmadụ ọ bụ?”
2KI 1:8 Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ nwoke yi uwe e ji ajị anụ kpaa; o kere ihe okike akpụkpọ anụ nʼukwu ya.” Eze sịrị, “Ọ bụ Ịlaịja, onye amụma si Tishbe!”
2KI 1:9 Mgbe ahụ, eze zigara otu onyeisi agha ya, na iri ndị agha ise ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha ahụ bịarutere hụ Ịlaịja ka ọ nọ ala nʼelu ugwu, onyeisi agha ahụ kpọrọ Ịlaịja sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo!’ ”
2KI 1:10 Ịlaịja zara sị ha, “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke dịka i kwuru, ka ọkụ si nʼeluigwe daa rechapụ gị na iri ndị a agha ise so gị.” Otu mgbe ahụ, ọkụ sitere nʼeluigwe daa rechapụ iri ndị agha ise ahụ na onyeisi ha.
2KI 1:11 Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ha bịarutere hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ kpọkuru ya sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo, bịa ngwangwa!’ ”
2KI 1:12 Ịlaịja zara sị ya, “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke dịka i kwuru, ka ọkụ si nʼeluigwe daa rechapụ gị na iri ndị agha ise gị na ha so.” Ngwangwa, ọkụ Chineke si nʼeluigwe daa rechapụ ha.
2KI 1:13 Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha a bịara hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ rigoro nʼelu ugwu gbuo ikpere nʼala nʼihu Ịlaịja rịọọ ya amara sị ya, “Onye nke Chineke, biko, meere ohu gị na iri ndị agha ise mụ na ha so ebere.
2KI 1:14 Lee, ọkụ esitela nʼeluigwe rechapụ ndịisi agha abụọ ahụ buru ụzọ, ha na ndị agha ha. Ugbu a, biko, arịọ m gị, chebe ndụ anyị.”
2KI 1:15 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja okwu sị ya, “Atụla egwu! Soro ya gaa!” Ya mere, Ịlaịja sooro onyeisi agha ahụ gaa nʼihu eze.
2KI 1:16 Mgbe Ịlaịja ruru nʼihu eze, ọ gwara eze okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ọ bụ nʼihi na Chineke anọghị nʼIzrel ka i ji zipụ ndị ozi ka ha gaa jụta ase site nʼaka Baal-Zebub, chi ndị Ekrọn? Ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, ị gaghị esite nʼihe ndina gị bilie. Ị ga-anwụrịrị!”
2KI 1:17 Ọ nwụrụ dịka okwu Onyenwe anyị nke Ịlaịja kwuru si dị. Nʼihi na Ahazaya enweghị nwa nwoke ọbụla, Jehoram nọchiri anya ya dịka eze, nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoram nwa Jehoshafat, bụ eze Juda.
2KI 1:18 Akụkọ banyere ịbụ eze nke Ahazaya, na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel?
2KI 2:1 O ruo mgbe Onyenwe anyị chọrọ ị kpọrọ Ịlaịja laa nʼeluigwe site nʼoke ifufe, Ịlaịja na Ịlaisha nọ nʼụzọ sitere Gilgal.
2KI 2:2 Ịlaịja sịrị Ịlaisha, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Betel.” Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro gaa Betel.
2KI 2:3 Nʼebe ahụ, ụmụ okorobịa ndị amụma nọ na Betel pụtara zute ha abụọ. Ndị amụma ahụ bịakwutere Ịlaisha sị ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-esi nʼebe ị nọ wepụ onyenwe gị Ịlaịja taa?” Ịlaisha sịrị, “Mụ onwe m maara, ma unu nọrọ nwayọọ.”
2KI 2:4 Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Ịlaisha, nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Jeriko.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere ha abụọ sokwaara ruo Jeriko.
2KI 2:5 Ndị otu ndị amụma nọ na Jeriko bịakwutere Ịlaisha nso jụọ ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-ewepụ onyenwe gị taa?” Ọ zara, “E, amaara m, ya mere nọọnụ nwayọọ.”
2KI 2:6 Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ka m jee Jọdan.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro na-eje.
2KI 2:7 Iri ndị amụma ise sitere nʼetiti ndị amụma sooro ha guzoro nʼebe dị anya na ncherita ihu ebe Ịlaịja na Ịlaisha kwụsịrị nʼakụkụ Jọdan.
2KI 2:8 Mgbe ahụ, Ịlaịja chịịrị uwe mwụda ya, pịakọtaa ya, tie ya nʼelu osimiri ahụ. Mmiri ahụ kewara ụzọ abụọ, ala akọrọ pụtakwara. Nʼebe ahụ ka Ịlaịja na Ịlaisha si gafee nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ.
2KI 2:9 Mgbe ha abụọ gafesịrị, Ịlaịja jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị tupu e site nʼebe ị nọ wepụ m?” Ịlaisha rịọrọ sị ya, “Biko, mee ka m nweta ụdị mmụọ i nwere okpukpu abụọ.”
2KI 2:10 Ịlaịja zara sị ya, “Ihe ị rịọrọ bụ ihe sịrị ike omume. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-ewepụ m site nʼebe ị nọ, ị ga-enweta ihe ị rịọrọ. Ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ị gaghị enweta ihe ị rịọrọ.”
2KI 2:11 Mgbe ha na-aga nʼihu nʼije ha na-akparịta ụka, na mberede, ụgbọ ọkụ nke ịnyịnya ọkụ na-adọkpụ pụtara ihe kewaa ha abụọ. Mgbe ahụ kwa oke ifufe buuru Ịlaịja rigoro nʼeluigwe.
2KI 2:12 Ịlaisha hụrụ ya, lelie anya elu tie mkpu akwa sị, “Nna m! Nna m! Usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!” Ọ hụkwaghị Ịlaịja anya ọzọ. O jidere uwe o yi nʼahụ dọwaa ya ibe abụọ.
2KI 2:13 Emesịa, ọ chịlịri uwe mwụda Ịlaịja nke dapụrụ mgbe e weliri ya elu, laghachi bịa guzo nʼakụkụ osimiri Jọdan.
2KI 2:14 O tiri akwa ahụ nʼelu mmiri ahụ jụọ sị, “Olee ebe Onyenwe anyị, Chineke Ịlaịja nọ?” Mgbe o tiri mmiri ahụ ihe, o kewakwara otu ụzọ nʼaka nri nke ọzọ nʼaka ekpe, Ịlaisha gafere nʼofe nke ọzọ.
2KI 2:15 Mgbe ndị amụma ahụ si Jeriko nʼele anya, hụrụ ihe mere, ha sịrị, “Mmụọ Ịlaịja adakwasịla Ịlaisha.” Ha gara zute ya, kpọọ isiala nʼihu ya.
2KI 2:16 Ha sịrị ya “Lee, anyị bụ ndị ohu gị nwere iri ndị ikom ise ahụ siri ike. Kwere ka ha ga chọgharịa nna gị ukwu. Ma eleghị anya mmụọ Onyenwe anyị eburula ya tụdakwa ya nʼotu ugwu, maọbụ nʼotu ndagwurugwu.” Ịlaisha zaghachiri, “Unu ezigala ha.”
2KI 2:17 Ma mgbe ha nọgidere rịọsie ya arịrịọ ike, ruo mgbe o nwekwaghị ike igbochi ha. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, ziganụ mmadụ ka ha gaa chọọ ya.” Ha zigara iri ndị ikom ise, ndị gara chọgharịa Ịlaịja ụbọchị atọ, ma ha achọtaghị ya.
2KI 2:18 Ịlaisha nọ na Jeriko mgbe ndị a lọghachiri bịa kọọrọ ya otu ha si gaa. Mgbe ahụ, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ na m agwaghị unu sị unu ejela?”
2KI 2:19 Ndị obodo ahụ sịrị Ịlaisha, “Lee, onyenwe anyị, obodo anyị dị nʼebe dị mma, dịka gị onwe gị na-ahụ, ma mmiri dị nʼime ya jọrọ njọ, ala ya adịghị amịpụta mkpụrụ dịka o kwesiri.”
2KI 2:20 Ịlaisha zara sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ tinye nnu nʼime efere ọhụrụ wetara m ya.” Ha gara weta efere ọhụrụ nke nnu juru nʼime ya.
2KI 2:21 Ịlaisha buuru nnu ahụ gaa nʼebe mmiri ahụ si asọpụta, wụnye nnu ahụ nʼime ya. Mgbe ọ na-eme nke a, o kwuru okwu sị, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Agwọọla m mmiri a. Ọnwụ maọbụ amịghị mkpụrụ nke ala agaghị adịkwa.’ ”
2KI 2:22 Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, mmiri ahụ dịịrị ọcha ruo taa, dịka Ịlaisha kwuru.
2KI 2:23 Emesịa, Ịlaisha sitere na Jeriko pụọ ịlaghachi Betel. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ụfọdụ ụmụ okorobịa nta sitere nʼime obodo pụta, bidoro jiri ya na-eme ihe ọchị, sị ya, “Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ! Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ!”
2KI 2:24 Ịlaisha tụgharịrị lee ha anya, bụọ ha ọnụ nʼaha Onyenwe anyị. Otu mgbe ahụ, nne anụ ọhịa abụọ, a na-akpọ bịa, sitere nʼọhịa pụta, dọgbuo iri ụmụ okorobịa anọ na abụọ nʼime ha.
2KI 2:25 Emesịa, Ịlaisha sitere nʼebe ahụ pụọ jeruo nʼugwu Kamel. Emesịakwa, o sitere nʼebe ahụ laghachi na Sameria.
2KI 3:1 Jehoram nwa Ehab, malitere ịbụ eze ndị Izrel na Sameria nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Jehoshafat na Juda. Afọ iri na abụọ ka ọ chịrị dịka eze.
2KI 3:2 O mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ bụghị dịka nna ya na nne ya mere. O wezugara nkume ahụ e doro nsọ nye Baal nke nna ya kpụrụ.
2KI 3:3 Otu ọ dị, ọ nọgidere na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel baa nʼime mmehie ife arụsị. Joram esiteghị na ha wezuga onwe ya.
2KI 3:4 Eze ndị Moab, bụ Misha, na ndị ya, bụ ndị na-azụ atụrụ. Nʼafọ niile, ọ na-atụrụ eze Izrel otu narị puku ajị ebule, na otu narị puku atụrụ.
2KI 3:5 Ma mgbe Ehab eze Izrel nwụrụ, eze Moab nupuru isi megide eze Izrel, jụkwa ịnọ nʼokpuru ya ọzọ.
2KI 3:6 Ya mere, eze Joram sitere na Sameria pụọ ga kpọkọta ndị Izrel niile.
2KI 3:7 O zigara Jehoshafat eze Juda ozi sị ya, “Eze Moab enupula isi megide m. Ị ga-abịa soro m ịga buso ndị Moab agha?” Ọ zaghachiri, “Aga m eso gị gaa. Mụ na gị bụ otu, ndị m bụ ndị gị, ịnyịnya m bụkwa ịnyịnya gị.”
2KI 3:8 “Ma olee ụzọ anyị ga-esi gaa ibu agha ahụ?” Joram zara, “Anyị ga-esi ụzọ ọzara Edọm.”
2KI 3:9 Ya mere, eze Izrel na eze Juda, na eze Edọm, na ndị agha ha niile, zukọtara site ụzọ ọzara Edọm ịga ibuso Moab agha. Ha gara ije abalị asaa nʼọzara. Ma mmiri ọṅụṅụ ha nwere gwụsịrị. Ọ dịkwaghị mmiri dịrị anụ ụlọ ha, na ndị agha ha.
2KI 3:10 Mgbe ahụ, eze Izrel tiri mkpu sị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Ọ ga-abụ na Onyenwe anyị kpọpụtara anyị bụ eze atọ ndị a, nʼebe a, inyefe anyị nʼaka ndị Moab, ka ha merie anyị?”
2KI 3:11 Ma Jehoshafat, eze Juda, jụrụ ajụjụ sị, “Ọ bụ na o nweghị onye amụma Onyenwe anyị nọ nʼebe a, onye anyị ga-esi nʼaka ya jụta Onyenwe anyị ase, site na ya?” Otu onyeisi agha ndị Izrel sị ha, “Ịlaisha, nwa Shafat, onye jeere Ịlaịja ozi, nọ nʼebe a.”
2KI 3:12 Jehoshafat zara sị, “Okwu Onyenwe anyị dị nʼọnụ ya.” Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat, na eze Edọm, gakwuru ya.
2KI 3:13 Ịlaisha zara eze Izrel sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ? Jekwuru ndị amụma nne gị na nna gị, jụta ha ase.” Eze Izrel zara sị ya, “Mba, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị kpọpụtara anyị bụ eze atọ nʼebe a, ka o were anyị nyefee nʼaka ndị Moab.”
2KI 3:14 Ịlaisha sịrị, “Ebe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, bụ onye m na-efe, a si na ọ bụghị nsọpụrụ m nwere nʼebe Jehoshafat eze Juda nọ, agaraghị m atụpụrụ gị ọnụ maọbụ lee gị anya nʼihu.
2KI 3:15 Ma ugbu a, kpọtaranụ m onye na-akpọ ụbọ.” Mgbe ọkpọ ụbọ ahụ malitere ịkpọ ụbọ ya, aka Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaisha.
2KI 3:16 Ọ sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, aga m eme ka ndagwurugwu a jupụta nʼolulu mmiri.
2KI 3:17 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu agaghị ahụ ifufe maọbụ mmiri ozuzo, ma ndagwurugwu a ga-ejupụta na mmiri, unu onwe unu ga-aṅụ, na ehi unu, na anụmanụ ndị ọzọ unu ga-aṅụkwa mmiri.
2KI 3:18 Ma nke a bụ ihe dị nta nʼebe Onyenwe anyị nọ, nʼihi na ọ ga-enyefekwa ndị Moab nʼaka unu.
2KI 3:19 Unu ga-etigbu obodo ọbụla e wusiri ike, na obodo ukwu niile. Unu ga-egbudakwa ezi osisi ha na-amị mkpụrụ, kpọchie isi mmiri ha niile, werekwa nkume mebikwaa ezi ala ubi ha niile.”
2KI 3:20 O ruo, nʼụtụtụ, nʼoge e ji achụ aja nsure ọkụ ụtụtụ, lee na mmiri sitere ụzọ Edọm sọọrọ bịa nʼebe ahụ ha gwuru olulu na ndagwurugwu ala ahụ sọjuo ala ahụ niile.
2KI 3:21 Mgbe ndị Moab nụrụ na ndị eze ahụ na-abịa imegide ha, ha kpọkọtara ndị ikom ọbụla nwere ike ịlụ agha, ma okenye ma okorobịa, pụta bịa guzo nʼoke ala ha.
2KI 3:22 Mgbe chi bọrọ nʼisi ụtụtụ, anyanwụ wara mụkwasị mmiri ahụ. Site nʼebe ha nọ, ndị Moab lepụrụ anya hụ mmiri ahụ ka ọ na-acha ọbara ọbara.
2KI 3:23 Mgbe ahụ, ha sịrịtara onwe ha, “Leenụ ọbara! Ọ ga-abụ na ndị agha eze atọ ndị a etigbuola onwe ha. Pụtanụ, unu ndị Moab, ka anyị gaa kwakọrọ ihe nkwata na-agha!”
2KI 3:24 Mgbe ha gbaara ọsọ bịaruo nʼụlọ agha ndị Izrel, ndị agha Izrel biliri malite itigbu ha. Ya mere, ndị agha Moab sitere nʼihu ha gbalaga. Ma ndị agha Izrel banyere nʼime obodo ndị Moab, gbuo ihe niile ha hụrụ nʼụzọ.
2KI 3:25 Ha tidara obodo ndị Moab niile, tinye nkume nʼala ubi ọma ndị Moab niile. Ha kpọchiri isi mmiri niile, gbudasịakwa ezi osisi niile na-amị mkpụrụ nʼala ahụ. Nʼikpeazụ, ọ bụ naanị otu obodo ndị Moab fọdụrụ, isi obodo a na-akpọ Kia Hareset. Ndị ji ụdọ na-ama nkume gbara obodo a gburugburu, bido ibuso ya agha.
2KI 3:26 Mgbe eze Moab hụrụ na agha ahụ anaghị agaziri ya nke ọma, ọ chịịrị narị ndị agha asaa, ndị ji mma agha ebu agha, gbalịa isi nʼetiti ndị agha Izrel tikapụta, na ncherita ihu ebe eze Edọm nọ, ma ha enweghị ike.
2KI 3:27 Ya mere, o weere ọkpara ya, onye gaara abụ eze nʼọnọdụ ya, gbuo ya, dịka aja nʼelu mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu nye chi Moab. Iwe dị ukwuu dị nʼụbọchị ahụ megide Izrel. Ha kwụsịrị ibu agha, laghachi nʼobodo nke aka ha.
2KI 4:1 Otu ụbọchị, otu nwanyị nʼime ndị inyom ndị amụma bịakwutere Ịlaisha rịọ ya sị, “Ohu gị, bụ di m anwụọla. Ị matara na ọ na-atụ egwuOnyenwe anyị. Ma ugbu a, onye o ji ụgwọ na-abịa ịkpọrọ ụmụ m ndị ikom abụọ ime ka ha bụrụ ndị ohu ya.”
2KI 4:2 Ịlaisha jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere gị? Gwa m, gịnị ka i nwere nʼụlọ?” Nwanyị ahụ zara sị, “O nweghị ihe ọbụla ohu gị nwanyị nwere nʼụlọ karịa naanị ntakịrị mmanụ.”
2KI 4:3 Ịlaisha sịrị, “Jegharịa na-ezi, gaa nata ndị agbataobi gị niile ite nke ihe ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha abụkwala ole na ole.
2KI 4:4 Mgbe ahụ, baa nʼime ụlọ, gị na ụmụ gị, mechibido onwe unu ụzọ. Malite ịgbanye mmanụ ahụ nʼime ite ahụ niile, mgbe nke ọbụla juru, bupụ ya nʼotu akụkụ.”
2KI 4:5 Nwanyị ahụ hapụrụ ya, ga mechibido onwe ya na ụmụ ya ndị ikom ụzọ. Ha na-ebutere ya ite niile ahụ nso, ebe ya onwe ya na-agbanye agbanye nʼime ha.
2KI 4:6 Mgbe ọ gbajuru ite ndị ahụ niile, ọ sịrị nwa ya, “Butere m ite ọzọ.” Ma ọ zara, “O nweghị ite ọzọ fọdụrụ.” Mgbe ahụ, mmanụ ahụ kwụsịrị ịgbapụta.
2KI 4:7 Ọ gara gwa onye nke Chineke ahụ, onye sịrị, “Gaa, ree mmanụ ahụ, kwụkwaa ụgwọ unu ji. Gị na ụmụ gị ndị ikom were nke fọdụrụ mee mkpa dịrị unu.”
2KI 4:8 Otu ụbọchị, Ịlaisha gara nʼobodo Shunem. Otu nwanyị nwere ugwu bi nʼebe ahụ. Nwanyị ahụ rịọsiri ya ike ka o rie nri. Nʼihi ya, mgbe ọbụla Ịlaisha si nʼebe ahụ gafee, ọ na-akwụsị nʼebe ahụ rie ihe.
2KI 4:9 Ma nwanyị ahụ gwara di ya okwu sị, “O doro m anya nke ọma na nwoke a na-akwụsị nʼụlọ anyị mgbe niile bụ onye nsọ nke Chineke.
2KI 4:10 Biko, ka anyị doziere ya otu ọnụụlọ nta nʼime ụlọ elu anyị, ka anyị tinyere ya ihe ndina na tebul, na oche, na oriọna, ka o nwee ebe ọ ga na-anọ mgbe ọbụla ọ bịakwutere anyị.”
2KI 4:11 Otu ụbọchị, mgbe Ịlaisha bịakwara nʼebe ahụ, ọ bara nʼọnụụlọ ahụ, dinaa nʼebe ahụ.
2KI 4:12 Ọ sịrị Gehazi onye na-ejere ya ozi, “Gaa kpọọ onye Shunem a,” Ya mere, ọ kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼihu ya,
2KI 4:13 Ịlaisha gwara Gehazi, “Gwa nwanyị ahụ, sị, ‘Lee, otu i si enye onwe gị nsogbu niile ndị a maka anyị. Ugbu a, gịnị ka a ga-emere gị? Ọ bụ ka anyị gwa eze okwu banyere gị, ka ọ bụ ịgwa onyeisi ndị agha?’ ” Ọ zara, “Ebi m nʼetiti ndị m.”
2KI 4:14 Ịlaisha jụrụ, “Gịnịkwa ka anyị ga-emere nwanyị a?” Gehazi sịrị, “Nʼezie, o nweghị nwa nwoke, di ya emeekwala agadi.”
2KI 4:15 Ịlaisha sịrị, “Kpọọ ya.” Ya mere, Gehazi kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼọnụ ụzọ.
2KI 4:16 Ịlaisha sịrị, “Na mgbe dị otu a nʼafọ ọzọ, ị ga-eku nwa nwoke nʼaka gị abụọ.” Ọ sịrị, “Mba, onyenwe m, biko, gị onye nke Chineke, agwala ohu gị nwanyị okwu ụgha.”
2KI 4:17 Ma dịka Ịlaisha si kwuo, nwanyị ahụ tụụrụ ime, na mgbe ahụ nʼafọ ọzọ ya, ọ mụrụ nwa nwoke.
2KI 4:18 Nwata ahụ toputara, otu ụbọchị ọ pụrụ jekwuru nna ya nʼubi, ebe ha nọ na-aghọ ọka.
2KI 4:19 O tikuru nna ya sị ya, “Isi m o, isi m o!” Nna ya sịrị otu nʼime ndị ohu ya, “Kuru ya kulaara nne ya.”
2KI 4:20 O kuuru ya, kulaara ya nne ya, nwantakịrị nwoke ahụ nọdụrụ nʼapata nne ya ruo etiti ehihie, mgbe ọ nwụrụ.
2KI 4:21 Nne ya kuuru ya rigoo nʼelu ụlọ ahụ, tọgbọ ya nʼelu ihe ndina ahụ onye nke Chineke ahụ na-edina, mechie ụzọ pụọ.
2KI 4:22 O ziri ozi kpọọ di ya sị ya, “Biko, zitere m otu okorobịa na otu ịnyịnya ibu, ka m jekwuru onye Chineke ahụ. Aga m alọtakwa ọsịịsọ.”
2KI 4:23 Ọ sịrị, “Gịnị mere i ji ejekwuru ya taa? Ọ bụghị Ọnwa ọhụrụ, ọ bụghịkwa ụbọchị izuike.” Ọ zara sị, “Udo dị.”
2KI 4:24 Mgbe ahụ, ọ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ibu ahụ, nye nwokorobịa ahụ iwu sị ya, “Gbasie ọsọ ike. Akwụsịkwala ịgba ọsọ ma ọ bụghị mgbe m gwara gị kwụsị.”
2KI 4:25 Ya mere, o buliri ije, gakwuru onye nke Chineke nʼugwu Kamel. Mgbe o lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, onye nke Chineke sịrị odibo ya bụ Gehazi, “Lee nwanyị Shunem ahụ.
2KI 4:26 Gbara ọsọ gaa zute ya jụọ ya sị ya, ‘Ọ dịkwa mma? Dị gị ọ nọkwa nʼudo? Nwa gị ọ nọkwa nʼudo?’ ” Mgbe Gehazi zutere ya jụọ ajụjụ ndị a, nwanyị ahụ zara Gehazi sị ya, “E, anyị niile nọ nʼudo, ihe niile na-aga nke ọma.”
2KI 4:27 Ma mgbe ọ bịakwutere onye nke Chineke, ọ dara nʼala nʼihu ya, jide ya nʼụkwụ ya abụọ. Gehazi bịaruru nso inupu ya, ma onyeozi Chineke sịrị ya, “Hapụ ya aka, nʼihi na ọ dị ihe na-enye ya nsogbu nʼime mmụọ ya, ma Onyenwe anyị zonarịrị m ya, ọ gwaghịkwa m ihe mere.”
2KI 4:28 Nwanyị ahụ sịrị, “Onyenwe m, arịọrọ m gị nye m nwa nwoke? Ọ bụ na m asịghị gị, ‘emeela m ka m nwee olileanya’?”
2KI 4:29 Ịlaisha sịrị Gehazi, “Ngwa, were ihe ike nʼukwu jikọta uwe mwụda gị, werekwa mkpanaka m nʼaka gị, bilie gaa Shunem. Mgbe ị na-aga ekelekwala onye ọbụla ekele. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ekelee gị, azala ekele ya. Gaa nʼụlọ ahụ. I ruo, tụkwasị mkpanaka m nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ.”
2KI 4:30 Ma nne nwantakịrị ahụ zara sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị laa.” Ịlaisha biliri soro ya bido ịla nʼụlọ ya.
2KI 4:31 Ma Gehazi butere ụzọ rute nʼụlọ ahụ, were mkpanaka ahụ tụkwasị nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ, ma nke a emeghị ka nwantakịrị ahụ teta ma ọ bụkwanụ kuo ume. Ya mere, Gehazi laghachiri izute Ịlaisha, gwa ya sị, “Nwata ahụ etetaghị.”
2KI 4:32 Mgbe Ịlaisha rutere nʼụlọ ahụ, ọ hụrụ ka nwantakịrị ahụ nwụrụ anwụ dina nʼelu ihe ndina ya.
2KI 4:33 Ọ banyere nʼime ọnụụlọ ahụ, mechibido ha abụọ ụzọ, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị.
2KI 4:34 Emesịa, ọ makpuuru nʼelu nwantakịrị ahụ, tụkwasị ọnụ ya nʼọnụ nwantakịrị ahụ, na anya ya abụọ na nke nwantakịrị ahụ, na aka ya abụọ na nke ya. Mgbe o si otu a dinara nʼelu nwantakịrị ahụ, ahụ nwantakịrị ahụ malitere ikpo ọkụ ọzọ.
2KI 4:35 Ịlaisha biliri jegharịa nʼime ụlọ ahụ ugboro ole na ole, laghachikwa makpuru nʼelu nwantakịrị ahụ ọzọ. Emesịa, nwantakịrị ahụ zere uzere ugboro asaa, meghe anya ya abụọ.
2KI 4:36 Ịlaisha kpọrọ Gehazi sị ya, “Kpọọ nwanyị Shunem.” Ya mere, ọ kpọrọ ya. Mgbe ọ bịakwutere ya, ọ sịrị, “Kuru nwa gị.”
2KI 4:37 Ọ batara, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọ isiala. Emesịa, o kuuru nwa ya nwoke pụọ.
2KI 4:38 Ịlaisha lọghachiri na Gilgal, mgbe ụnwụ dị nʼala ahụ. Otu ụbọchị, mgbe ya na ụfọdụ ndị amụma nọ na-enwe nzukọ, ọ gwara onye na-ejere ya ozi okwu sị ya: “Sikwasị ite ukwu ahụ nʼọkụ, siere ndị a mụ na ha nọ ihe oriri.”
2KI 4:39 Otu onye nʼime ha pụrụ banye nʼọhịa ịchịkọta akwụkwọ nri. Ọ hụrụ osisi vaịnị toro nʼọhịa, chịkọtaa ụfọdụ afụfa ọhịa, nke o kpojuru nʼuwe mwụda ya dịka ọ ga-ejideli. Mgbe ọ lọghachiri, o gbupịasịrị afụfa ọhịa ndị a, wụnye ha nʼime ite ahụ si nʼọkụ, ọ bụ ezie na o nweghị onye maara ihe ha bụ.
2KI 4:40 Mgbe o ghere, a wụpụtara ya nye ndị ikom ndị ahụ. Ma mgbe ha bidoro iri ya, ha tiri mkpu akwa sị, “Onye nke Chineke, lee, ọnwụ dị nʼite nri a.” Ha enwekwaghị ike iri ya.
2KI 4:41 Ịlaisha kwuru okwu sị, “Kpotanụ ụtụ ọka.” Ọ ghanyere ya nʼime ite ahụ sị, “Kunyerenụ ha nri ka ha rie.” Ha riri ya. O nwekwaghị ihe na-egbu egbu dị nʼite ahụ.
2KI 4:42 Otu nwoke si Baal-Shalisha bịa, butere onye nke Chineke ogbe achịcha iri abụọ nke e ji ọka balị mbụ a ghọtara nʼubi mee. O butekwaara ya isi ọka ole na ole nʼakpa. Ịlaisha sịrị, “Were ihe ndị a nye ndị anyị ka ha rie.”
2KI 4:43 Onye na-ejere ya ozi jụrụ, “Olee otu m ga-esi chee ihe a nʼihu narị mmadụ?” Ma Ịlaisha zara, “Chịrị ya nye ndị mmadụ a ka ha rie, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ha ga-eriju afọ ha, nwekwa ndị ga-afọdụkwa.’ ”
2KI 4:44 Ya mere, o chere ya nʼihu ha, ha rikwara, nri ahụ fọdụkwara dịka okwu Onyenwe anyị si dị.
2KI 5:1 Nʼoge a, Neeman bụ ọchịagha ndị agha eze Aram, Ọ bụ onye dị ukwuu nʼanya nna ya ukwu, bụrụkwa onye a na-enye nsọpụrụ nʼihi na Onyenwe anyị sitere nʼaka ya nye ndị agha Aram mmeri nʼọgbọ agha dị iche iche. Ọ bụ dike na dimkpa nʼagha, maọbụ onye ekpenta.
2KI 5:2 Otu mgbe, ụfọdụ nʼime ndị agha Aram na-apụnara ndị mmadụ ihe pụrụ ga dọta otu nwaagbọghọ nta site nʼIzrel, onye na-ejere nwunye Neeman ozi.
2KI 5:3 Ọ sịrị nne ya ukwu, “Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na nna m ukwu ga-aga hụ onye amụma nọ na Sameria. Ọ ga-agwọ ya ọrịa ekpenta a.”
2KI 5:4 Neeman nụrụ nke a, bilie gaa kọọrọ eze Aram ihe niile nwaagbọghọ a si Izrel kwuru.
2KI 5:5 Eze Aram sịrị, “Bilie, gaa, aga m ezigakwara eze Izrel akwụkwọ ozi.” Ya mere Neeman gara, ọ chịịrị talenti ọlaọcha iri, na puku shekel ọlaedo isii, na uwe ọma dị iche iche, nke dị iri nʼọnụọgụgụ.
2KI 5:6 Nke a bụkwa ihe dị nʼime akwụkwọ ahụ eze Aram degaara eze Izrel: “Nwoke a ji akwụkwọ a bịakwute gị bụ Neeman, onyeisi ndị agha m. Biko, achọrọ m ka ị gwọọ ya ọrịa ekpenta dị ya nʼahụ.”
2KI 5:7 Ngwangwa eze Izrel gụrụ akwụkwọ ahụ, ọ dọwara uwe ya sị, “Abụ m Chineke? A pụrụ m ime ka mmadụ nwụọ na ime ka mmadụ dị ndụ? Gịnị mere nwoke a ji ezitere m onye m ga-agwọ ọrịa ekpenta? Lee ka o si na-achọ ụzọ anyị ga-eji nwee esemokwu.”
2KI 5:8 Mgbe Ịlaisha onye Chineke nụrụ na eze Izrel dọwara uwe ya, o ziri ozi a zigara ya sị, “Gịnị mere i ji dọwaa uwe gị? Zitere m Neeman. Ọ ga-amatakwa na e nwere onye amụma nʼIzrel.”
2KI 5:9 Ya mere, Neeman bịarutere guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ Ịlaisha, ya na ịnyịnya ya, na ụgbọ agha ya.
2KI 5:10 Ịlaisha zigara onyeozi ya nke bịara zie sị ya, “Jee saa ahụ gị ugboro asaa nʼosimiri Jọdan. I mee nke a, ekpenta ahụ ga-esi nʼakụkụ ahụ gị niile pụọ. Ị ga-adịkwa ọcha.”
2KI 5:11 Ma Neeman were iwe nke ukwuu tụgharịa bido ịlaghachi ebe o si bịa. Mgbe ọ na-ala, ọ na-ekwu na-asị, “Echere m na ọ ga-apụkwute m, guzo, kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya, fufee aka ya nʼebe ahụ ọrịa m dị, gwọọ m ọrịa ekpenta m.
2KI 5:12 Abana na Fapa, bụ osimiri dị na Damaskọs, ha adịghị mma karịa mmiri Izrel niile? Ọ bụ na m enweghị ike ịsa ahụ nʼime ha ma dị ọcha.” Ọ tụgharịrị jiri ọnụma pụọ.
2KI 5:13 Ma ndị ozi Neeman jekwuru ya sị ya, “Nna anyị, a sị na ọ bụ ihe sịrị ike nke ukwuu ka onye amụma ahụ gwara gị sị gị mee, ị garaghị eme ya? Ma ihe ọ sị gị mee bụ naanị ‘Gaa saa ahụ gị ka ị dị ọcha.’ ”
2KI 5:14 Ya mere, ọ gara sụnye onwe ya nʼime osimiri Jọdan ugboro asaa, dịka onye nke Chineke gwara ya. Anụ ahụ ya lọghachiri dị ọcha ka anụ ahụ nwantakịrị.
2KI 5:15 Mgbe ahụ, Neeman na ndị niile ya na ha so laghachikwutere onye nke Chineke. O guzoro nʼihu ya sị, “Ugbu a amatala m na ọ dịghị Chineke ọzọ dị nʼụwa niile ma ọ bụghị naanị nʼIzrel. Ya mere, biko, nara onyinye a site nʼaka ohu gị.”
2KI 5:16 Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye m na-ejere ozi, agaghị m ana gị ihe ọbụla.” Ma Neeman rịọrọ ya arịrịọ ka ọ nara ya, ma ọ jụrụ ajụ.
2KI 5:17 Mgbe ahụ Neeman sịrị, “Ọ bụrụ na ị gaghị anara, biko, kwerenụ ka m kporo aja nke ịnyịnya abụọ nwere ike ibu. Nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, agaghị m achụrụ chi ọzọ aja nsure ọkụ, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị.
2KI 5:18 Ma ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị naanị otu ihe a. Mgbe nna m ukwu banyere nʼụlọ arụsị Rimọn ịkpọ isiala, mgbe ọ na-adabere nʼaka m, nke ga-eme ka mụ onwe m kpọọkwa isiala. Mgbe m si otu a kpọọ isiala nʼụlọ arụsị Rimọn, ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị nʼihi nke a.”
2KI 5:19 Ịlaisha zara sị ya, “Ọ dị mma, laa nʼudo.” Mgbe Neeman lawara, o jerubeghị ebe dị anya,
2KI 5:20 Gehazi, bụ onyeozi Ịlaisha onye nke Chineke, sịrị nʼobi ya, “Nna m ukwu emezighị ikwere ka Neeman onye Aram laa na-anataghị ya ihe o ji bịa. Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m eji ọsọ gbakwuru ya napụta ya ụfọdụ ihe ahụ.”
2KI 5:21 Ya mere, Gehazi gbara ọsọ gbakwuru Neeman. Mgbe Neeman hụrụ ya ka ọ gba ọsọ na-abịa, o si nʼelu ụgbọ agha ya wudata gaa zute ya, jụọ ya sị: “Udo ọ dịkwa?”
2KI 5:22 “E, udo dị,” ka Gehazi zara, “Onyenwe m zitere m ka m gwa gị, ‘Lee, ụmụ okorobịa abụọ nʼetiti ndị amụma si nʼugwu Ifrem bịakwute m. Biko nye ha otu talenti ọlaọcha na uwe mgbanwe abụọ.’ ”
2KI 5:23 Ma Neeman zara sị ya, “Biko, were talenti abụọ.” Ọ kwagidere Gehazi ka ọ nara ha. O kechiri talenti ọlaọcha abụọ ahụ nʼakpa abụọ, tinyere uwe mgbanwe abụọ. O bunyere ndị ohu ya ka ha buru ya na-aga nʼihu Gehazi.
2KI 5:24 Ma mgbe ha rutere nʼugwu, Gehazi naara ndị ohu Neeman ihe ndị ahụ, sị ha laghachikwa. O zoro ihe ndị ahụ nʼime ụlọ.
2KI 5:25 Mgbe ọ batara nʼụlọ guzo nʼihu nna ya ukwu, Ịlaisha jụrụ ya sị, “Ebee ka i si na-abịa Gehazi?” Ọ zara, “Ohu gị ejeghị ebe ọbụla.”
2KI 5:26 Mgbe ahụ Ịlaisha zara ya, “Ọ bụ na mmụọ m esoghị gị mgbe nwoke ahụ si nʼụgbọ ya rịdata izute gị? Oge a ọ bụ oge ịnara ego, na ịnara uwe, na ịnara ubi oliv, na ubi vaịnị, na igwe ehi, na igwe atụrụ, na ndị ohu ndị ikom, na ndị ohu ndị inyom na-eje ozi?
2KI 5:27 Nʼihi nke a, ekpenta ahụ dị Neeman ga-abịakwasị gị, na ụmụ ụmụ gị, ruo mgbe ebighị ebi.” Ya mere, Gehazi ghọrọ onye ekpenta si nʼihu ya pụọ. Anụ ahụ ya bidokwara ịcha ọcha dịka ogho ọcha.
2KI 6:1 Ụmụ ndị amụma gwara Ịlaisha okwu sị, “Lee, ebe a anyị bi nʼihu gị dị oke nta karịa.
2KI 6:2 Ya mere, ka anyị gaa nʼakụkụ Jọdan gbute osisi anyị ga-eji wuo ụlọ ebe anyị ga-ebi.” Ọ sịrị ha, “Meenụ ka unu kwuru.”
2KI 6:3 Ma otu onye nʼime ha rịọrọ ya sị, “Biko, nna anyị ukwu, soronụ anyị.” O kwenyere na ọ ga-eso ha.
2KI 6:4 O sonyekwara ha. Mgbe ha bịaruru nʼakụkụ Jọdan, ha malitere igbutu osisi.
2KI 6:5 Ma mgbe otu nʼime ha nọ na-egbutu otu osisi, anyụike ya dabara nʼime mmiri. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m. Ọ bụkwanụ ihe a rịọtara arịọta.”
2KI 6:6 Mgbe ahụ, onye nke Chineke jụrụ ya sị, “Ebee ka ọ dabara?” Mgbe o ziri ya ebe ọ dabara, Ịlaisha gbutere osisi tụba ya nʼebe ahụ, mee ka anyụike ahụ segolite na-erugharị nʼelu mmiri.
2KI 6:7 Ọ sịrị, “Tụtụlite ya.” O setịrị aka ya wepụta ya.
2KI 6:8 Nʼoge a, eze ndị Aram na ndị Izrel nọ nʼagha. Mgbe ya na ndịisi agha ya kparịtachara, ọ sịrị, “Aga m eguzobe ọmụma ụlọ ikwu m nʼebe dị otu a na nʼebe dị otu a.”
2KI 6:9 Ngwangwa, onye nke Chineke zigaara eze Izrel ozi sị, “Lezie anya, unu ejekwala nso nʼebe ahụ, nʼihi na eze Aram na ndị agha ya nọ nʼebe ahụ.”
2KI 6:10 Nʼihi nke a, eze Izrel mere nchọpụta banyere ebe ahụ onye nke Chineke gwara ya. Ọtụtụ mgbe Ịlaisha dọrọ eze aka na ntị, nʼihi ya, ha nọrọ na nche nʼebe ahụ niile.
2KI 6:11 Ihe ndị a mere ka iwe wee eze ndị Aram. Ọ kpọkọtara ndịisi ọrụ ya nye ha iwu sị, “Gwanụ m, onye nʼime anyị dịnyere eze Izrel?”
2KI 6:12 Otu onye nʼime ndị ọchịagha ya sịrị, “O nweghị onye ọbụla nʼime anyị, onyenwe m bụ eze. Ọ bụ Ịlaisha, onye amụma Izrel, bụ onye na-agwa eze Izrel okwu niile i na-ekwu nʼime ebe ndina gị.”
2KI 6:13 Ya mere, eze Aram nyere ha iwu sị ha, “Gaanụ, chọpụta ebe ọ nọ, ka m ziga ndị agha ga-aga jide ya.” Ha gara lọta, kọọrọ ya na Ịlaisha nọ na Dọtan.
2KI 6:14 Nʼihi ya, nʼotu anyasị eze Aram zigara ọtụtụ ndị agha ya, ndị ji ịnyịnya na ụgbọ agha gbaa obodo ahụ gburugburu.
2KI 6:15 Mgbe onye na-ejere onye nke Chineke ozi biliri ọtọ nʼisi ụtụtụ pụọ, ọ hụrụ ọtụtụ ndị agha na ịnyịnya na ụgbọala, ka ha gbara obodo ha nọ gburugburu. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m, gịnị ka anyị ga-eme ugbu a?”
2KI 6:16 Ma Ịlaisha zara sị ya, “Atụla egwu, nʼihi na ndị nọnyere anyị dị ọtụtụ karịa ndị nọnyeere ha.”
2KI 6:17 Mgbe ahụ, Ịlaisha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, biko, saghee anya ya abụọ ka ọ hụ.” Onyenwe anyị meghere anya ohu Ịlaisha, mee ka ọ hụ ịnyịnya ọkụ, na ụgbọala ọkụ jupụtara nʼugwu dị gburugburu ebe ahụ niile.
2KI 6:18 Mgbe ndị iro ahụ na-abịaru ya nso, Ịlaisha kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Mee ka ìsì kpuo ndị agha niile.” O mekwara ka ìsì kpuo ha, dịka Ịlaisha rịọọrọ.
2KI 6:19 Ịlaisha pụtara sị ha, “Nke a abụghị ụzọ, nke a abụkwaghị obodo unu na-achọ. Soronụ m, ka m gosi unu nwoke unu na-achọ.” O duuru ha jee Sameria.
2KI 6:20 Mgbe ha bịaruru Sameria, Ịlaisha kpere ekpere sị, “Biko, Onyenwe anyị, ugbu a meghee anya ha, ka ha hụ ụzọ.” Onyenwe anyị meghere anya ha dịka Ịlaisha kpere nʼekpere; ha matakwara na ha nọ na Sameria.
2KI 6:21 Mgbe eze Izrel hụrụ ha, ọ jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Nna m, ị chọrọ ka m gbuo ha?”
2KI 6:22 Ịlaisha zara sị ya, “Egbula ha. Ị ga-egbu ndị i ji mma agha na ụta gị dọta nʼagha? Nye ha nri na mmiri, zilaga ha ka ha lakwuru onyenwe ha.”
2KI 6:23 Ya mere, ọ kwadooro ha oke oriri dị ukwuu, mgbe ha riri, ṅụkwaa, o zilagara ha, ha lakwuuru nna ha ukwu. Site nʼoge ahụ gaa nʼihu, ndị otu Aram na-apụnara mmadụ ihe kwusịrị inye nsogbu nʼoke ala ndị Izrel.
2KI 6:24 Ma mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ben-Hadad, eze Aram, chịkọtara ndị agha ya niile pụta bịa gbaa Sameria gburugburu.
2KI 6:25 Nʼihi nke a, oke ụnwụ dara nʼobodo Sameria. Nri kọrọ nʼala ahụ ruo na e bidoro ire otu isi ịnyịnya ibu iri shekel ọlaọcha asatọ. E rekwara nsị nduru shekel ise.
2KI 6:26 Mgbe eze Izrel na-agafe nʼelu mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu, otu nwanyị kpọkuru ya sị ya, “Nyere m aka, onyenwe m eze.”
2KI 6:27 Ma eze zara sị ya, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekweghị inyere gị aka, ebee ka m ga-esi nwetara gị inyeaka? Ọ bụ site nʼebe ịzọcha ọka? Ka ọ bụ nʼebe ịzọcha mmanya vaịnị?”
2KI 6:28 Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị na-eme?” Ọ zara, “Nwanyị a sịrị, ‘Nye nwa gị nwoke ka anyị rie ya taa, echi anyị ga-eri nwa m nwoke.’
2KI 6:29 Ya mere, na anyị siri nwa m rie ya. Nʼụbọchị nke so ya asịrị m ya, ‘Wepụta nwa gị nwoke ka anyị rie ya,’ ma o zoola ya.”
2KI 6:30 Mgbe eze nụrụ okwu nwanyị a, ọ dọwara uwe ya. Ma dịka ọ na-agabiga nʼelu mgbidi ahụ, ndị mmadụ lere anya hụ nʼokpuru uwe, akwa mkpe dị nʼime ahụ ya.
2KI 6:31 Ọ sịrị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na isi Ịlaisha nwa Shafat anọgide nʼahụ ya taa.”
2KI 6:32 Nʼoge a, Ịlaisha nọdụrụ ala nʼụlọ ya, ndị okenye sokwa ya nọdụ. Eze zipụrụ onyeozi, ma tupu o rute, Ịlaisha gwara ndị okenye ahụ okwu sị ha, “Unu ahụla na ogbu mmadụ a ezitela mmadụ ka ọ bịa gbupụ m isi. Mgbe onyeozi ya bịaruru, mechienụ ụzọ hapụ ya nʼezi, nʼihi na eze nʼonwe ya ga-eso ya nʼazụ bịa.”
2KI 6:33 Mgbe Ịlaisha nọ na-agwa ha okwu, lee onyeozi ahụ ka ọ na-abịakwute ya. Eze sokwa ya nʼazụ na-ekwu okwu na-asị, “Onyenwe anyị emeela ka ihe ọjọọ dị otu a dakwasị anyị. Gịnị mere m ga-eji lee anya inyeaka site nʼaka Onyenwe anyị ọzọ?”
2KI 7:1 Ịlaisha zara sị ya, “Nụrụ okwu Onyenwe anyị. Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Nʼoge dịka mgbe a echi, a ga-ere otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, rekwaa akpa nta ọka balị abụọ otu shekel nʼọnụ ụzọ ama obodo Sameria.”
2KI 7:2 Ọchịagha ahụ, nke eze na-adabere nʼaka ya, sịrị onye nke Chineke, “Lee, a sịkwarị na Onyenwe anyị emeghee oghere idee nke eluigwe, nke a ọ pụrụ ime?” Ma Ịlaisha zara ya, “Ị ga-eji anya gị abụọ hụ ya, ma ị gaghị eri site nʼime ya.”
2KI 7:3 Nʼoge a, e nwere ndị ekpenta anọ nọ nʼezi mgbidi gbara Sameria gburugburu, nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka anyị nọ nʼebe a na-eme? Ọ bụ ka anyị nọrọ nʼebe a tutu anyị anwụọ?
2KI 7:4 Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Anyị ga-abanye nʼime obodo,’ ụnwụ dị nʼebe ahụ, anyị ga-anwụkwa. Ọ bụrụkwanụ na anyị anọgide nʼebe a anyị ga-anwụ. Ya mere ka anyị gafeenụ banye nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram, were onwe anyị nyefee ha nʼaka. Ọ bụrụ na ha edebe anyị ndụ, anyị ga-adị ndụ, ọ bụrụ na ha egbuo anyị, anyị ga-anwụkwa.”
2KI 7:5 Nʼoge uhuruchi, ha biliri gaa nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram. Mgbe ha bịarutere nʼọnụ ụlọ ikwu ahụ, o nwekwaghị onye nọ nʼebe ahụ,
2KI 7:6 nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ndị Aram nụ ụzụ ụgbọ agha na nke ịnyịnya, na nke usuu ndị agha. Nke a mere ka onye ọbụla gwa ibe ya sị, “Lee, eze ndị Izrel egoola ndị agha ndị Het, na ndị eze Ijipt ibuso anyị agha.”
2KI 7:7 Ha biliri gbapụ ọsọ nʼabalị ahụ, hapụ ụlọ ikwu ha niile, na ịnyịnya ha niile, na ịnyịnya ibu ha niile, na ihe niile otu o si dịrị, ma gbapụ ọsọ ndụ.
2KI 7:8 Mgbe ndị ekpenta ahụ rutere ogige ndị agha ndị Siria, ha banyere nʼime otu ụlọ rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ dị nʼime ya. Ha chịịrị ọlaọcha na ọlaedo na uwe ọma niile dị nʼime ya gaa zoo ha. Ọzọkwa, ha lọghachiri banye nʼụlọ ọzọ kwakọrọ ụfọdụ ihe dị nʼime ya gaa zoo.
2KI 7:9 Ma mgbe ahụ ha sịrịtara onwe ha, “Ihe anyị na-eme ezighị ezi. Taa bụ ụbọchị oziọma, ma lee ka anyị na-agba nkịtị. Ọ bụrụ na anyị echere ruo ìhè ụtụtụ, a ga-achọpụta ajọọ omume anyị. Ugbu a bịanụ, ka anyị gaa gwa ndị nọ nʼụlọeze, ihe anyị hụrụ.”
2KI 7:10 Ya mere, ha gara kpọkuo ndị nche ọnụ ụzọ obodo ahụ, gwa ha sị, “Anyị banyere nʼogige ndị agha Aram, o nweghị mmadụ ọbụla nọ nʼebe ahụ, ọ dịghị olu mmadụ anyị nụrụ nʼebe ahụ, naanị ịnyịnya na ịnyịnya ibu elibere nʼosisi, na ụlọ ikwu ha a hapụrụ dịka ha dị.”
2KI 7:11 Ndị na-eche nche tiri mkpu kọọrọ ndị nọ nʼụlọeze ihe mere.
2KI 7:12 Eze biliri nʼabalị ahụ gwa ndịisi ọrụ ya sị, “Ka m gwa unu ihe ndị Aram mere anyị. Ha maara na anyị nọ nʼoke agụụ, nʼihi ya, ha akpacharala anya hapụ ọmụma ụlọ ikwu ha gaa zoo onwe ha nʼime ọhịa. Echiche ha bụ, ‘Ndị a ga-apụtarịrị, mgbe ahụ, anyị ga-ejide ha na ndụ, banyekwa nʼime obodo ha.’ ”
2KI 7:13 Ma otu onye nʼime ndịisi agha ya zara sị ya, “Ka ụfọdụ mmadụ duru ịnyịnya ise ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo. Ọ bụrụ na ndị a alọtaghị ọnọdụ ha ga-adị ka nke ndị Izrel niile fọdụrụ nʼebe, e, ha ga-adị ka ndị Izrel niile a gụrụ dịka ndị nwụrụ anwụ. Ya mere, ka anyị zipụ ha ka ha gaa chọpụta ihe mere.”
2KI 7:14 Ya mere, ha họpụtara ụgbọ agha abụọ na ịnyịnya ndị na-adọkpụ ha. Eze zipụrụ ha ịchụso ndị agha Aram, O nyere ndị na-agba ha iwu sị, “Gaanụ chọpụta ihe mere.”
2KI 7:15 Ha sogidere ha ruo nʼosimiri Jọdan. Nʼakụkụ ụzọ niile jupụtara nʼuwe na ngwa agha ndị agha Aram tufuru mgbe ha na-eme ngwangwa. Ndị ahụ e zipụrụ lọghachiri bịa kọọrọ eze ihe ha hụrụ.
2KI 7:16 Ndị Izrel niile pụrụ gaa kwakọrọ ihe dị nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Aram. Nke bụ na e rere otu akpa nta ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma otu shekel, rekwaa akpa ọka balị abụọ otu shekel dịka Onyenwe anyị si kwuo.
2KI 7:17 Eze họpụtara ọchịagha ahụ, nke ọ na-adabere nʼaka ya, nye ya ọrụ ilekọta ọnụ ụzọ obodo ahụ. Ma ndị si nʼobodo na-enupụta nuturu ya, zọọ ya ụkwụ, zọgbuo ya mgbe ha na-agbapụta. Ọ nwụrụ dịka Ịlaisha onye nke Chineke kwuru mgbe eze bịakwutere ya ụnyaahụ, ijide ya.
2KI 7:18 Ihe niile mezuru dịka onye nke Chineke gwara eze okwu sị ya, “A ga-ere akpa nta ọka balị abụọ otu shekel na otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, nʼọnụ ụzọ ama Sameria.”
2KI 7:19 Nʼoge ahụ, ọchịagha ahụ na-ejere eze ozi zara sị ya, “Ihe dị otu a agaghị eme, ọ bụladị na Onyenwe anyị emeghee eluigwe mee ka nri zoo, nke a ọ ga-eme?” Ma onye nke Chineke zara ya, “Ị ga-eji anya gị hụ ya, ma ị gaghị eso rie ya.”
2KI 7:20 Ọ bụkwa otu a ka o si mee, nʼihi na ndị mmadụ zọgburu ya nʼụkwụ nʼọnụ ụzọ ama, ebe ọ nọ nwụọ.
2KI 8:1 Ịlaisha gwara nwanyị ahụ o mere ka nwa ya si nʼọnwụ bilie okwu sị ya, “Bilie, gị na ezinaụlọ gị, gaa nʼobodo ọzọ ebe unu ga-anọ dịka ọbịa nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na oke ụnwụ ga-adakwasị ala Izrel afọ asaa.”
2KI 8:2 Nwanyị ahụ mere dịka onye nke Chineke gwara ya, o biliri, ya na ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Filistia afọ asaa.
2KI 8:3 Mgbe ụnwụ ahụ gwụsịrị nʼafọ nke asaa, o si nʼala ndị Filistia lọta nʼIzrel. Mgbe ọ lọtara, o jekwuuru eze ka o nyere ya aka inwetaghachi ụlọ ya na ala ya.
2KI 8:4 Mgbe nwanyị ahụ bịakwutere eze, eze nọ na-agwa Gehazi bụ onye na-ejere onye nke Chineke ozi okwu sị ya, “Biko, kọọrọ m akụkọ ihe ukwu niile Ịlaisha mere.”
2KI 8:5 Mgbe Gehazi na-akọrọ eze otu Ịlaisha si mee ka nwantakịrị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ, nwanyị ahụ, onye bụ nne nwantakịrị ahụ, batara nʼime ụlọeze. Mgbe ahụ, Gehazi kwuru sị, “Onyenwe m eze, onye a bụ nwanyị ahụ, leekwa nwa ya nwoke, onye Ịlaisha mere ka ọ dị ndụ ọzọ.”
2KI 8:6 Eze jụrụ nwanyị ahụ ajụjụ sị ya, “Ọ bụ eziokwu?” Nwanyị ahụ kọọrọ eze akụkọ ihe niile mere. Mgbe ahụ, eze dunyere ya otu onyeisi nʼime ndị ozi ya ka o nyere ya aka inwetaghachi ihe ya niile, ya na ụgwọ ruru ya nʼihi mkpụrụ ubi ya niile ha ghọrọ mgbe ahụ o bi nʼala ndị Filistia.
2KI 8:7 Mgbe ihe ndị a gasịrị Ịlaisha gara Damaskọs, isi obodo ndị Siria. Nʼoge a, Ben-Hadad eze Aram, na-arịa ọrịa. “A gara gwa eze na onye nke Chineke abịala nʼebe ahụ.”
2KI 8:8 Mgbe eze nụrụ ya, ọ kpọrọ Hazael sị ya, “Were onyinye ịnata ihuọma nʼaka gị wegara onye nke Chineke, site nʼaka ya jụta Onyenwe anyị ase. Jụọ ya, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ”
2KI 8:9 Hazael weere iri ịnyịnya kamel anọ buru ezi ihe niile si nʼala Damaskọs, wetara Ịlaisha onyinye ndị a sị ya, “Nwa gị Ben-Hadad, eze Aram, zitere ka m jụọ gị sị, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ”
2KI 8:10 Ịlaisha zara sị ya, “Laa, gaa gwa ya sị ya, ‘Ị ga-esi nʼọrịa bilie.’ Ma Onyenwe anyị egosila m na, nʼezie, ọ ga-anwụ.”
2KI 8:11 Mgbe Ịlaisha nọ na-ekwu okwu a, o legidere Hazael anya nʼihu tutu ruo mgbe ihere mere ya. Mgbe ahụ, onye nke Chineke kwara akwa.
2KI 8:12 Mgbe ahụ, Hazael jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Ọ bụ gịnị mere onyenwe m ji akwa akwa?” Ịlaisha zara sị ya, “Nʼihi na amaara m ihe ọjọọ ị ga-eme ụmụ Izrel nʼoge dị nʼihu. Ị ga-akpọ obodo niile ha e wusiri ike ọkụ, jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha. Ị ga-atụpịa ụmụntakịrị na-aṅụ ara, bọwakwaa afọ ndị inyom dị ime.”
2KI 8:13 Hazael sịrị, “Olee otu ọrụ gị, bụ nkịta efu, ga-esi nwee ike imezu ihe ukwuu a?” Ịlaisha zara, “Onyenwe anyị egosila m na ị ga-abụ eze Aram.”
2KI 8:14 Mgbe Hazael, si nʼebe Ịlaisha nọ laa, ọ bịakwutere nna ya ukwu. Mgbe Ben-Hadad jụrụ ya sị, “Gịnị ka Ịlaisha gwara gị?” Hazael zara sị, “Ọ gwara m na ị ga-esi nʼọrịa bilie.”
2KI 8:15 Ma nʼechi ya, Hazael chịịrị akwa na-egbo oyi, banye ya na mmiri jiri ya baa nʼebe eze dina, gbasaa ya nʼihu eze, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ. Emesịa, Hazael ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 8:16 Nʼafọ nke ise nke ọchịchị Joram nwa Ehab eze Izrel, mgbe Jehoshafat bụ eze Juda, ka Jehoram nwa Jehoshafat malitere ọchịchị ya dịka eze Juda.
2KI 8:17 Ọ dị iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị afọ asatọ na Jerusalem.
2KI 8:18 O soro ụzọ ndị eze Izrel dịka ụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ ada Ehab. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
2KI 8:19 Ma nʼagbanyeghị nke a, nʼihi ohu ya bụ Devid Onyenwe anyị achọghị ibibi Juda. Nʼihi na o kwere nkwa ime ka oriọna dịịrị Devid na ụmụ ụmụ ruo mgbe ebighị ebi.
2KI 8:20 Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze.
2KI 8:21 Ya mere, Jehoram duuru ụgbọ agha ya niile gaa nʼobodo Zaịa. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu; ma ndị agha ya gbaghachiri azụ, laa nʼụlọ ha.
2KI 8:22 Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa. Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ.
2KI 8:23 Akụkọ ihe niile Jehoram mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Juda mere nʼụbọchị ndụ ha?
2KI 8:24 Joram sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri nna ya ha nʼobodo Devid. Ahazaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 8:25 Nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ka Ahazaya nwa Jehoram, bụ eze Juda malitere ịchị.
2KI 8:26 Ahazaya gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị otu afọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Atalaya, nwa nwa Omri, eze Izrel
2KI 8:27 O soro ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ nwanyị si nʼezinaụlọ Ehab.
2KI 8:28 Ahazaya sooro Joram nwa Ehab, gaa ibuso Hazael eze Aram agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ.
2KI 8:29 Ya mere, eze Joram lọghachitere na Jezril, ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ndị Aram merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ. Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram eze Juda, gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.
2KI 9:1 Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị, werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead.
2KI 9:2 I jeruo ebe ahụ, jee hụ Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi anya. Mee ka o bilie site nʼetiti ndị ha na ya nọ. Mekwaa ka gị na ya naanị baa nʼime ụlọ.
2KI 9:3 Were karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi gwa ya okwu sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ I mesịa, meghe ụzọ ọsịịsọ, sitekwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ.”
2KI 9:4 Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead.
2KI 9:5 Mgbe o jeruru, ọ hụrụ ebe ọchịagha ahụ nọdụrụ nʼala nʼetiti ndịisi agha ibe ya. O kwuru sị, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ọchịagha.” Jehu jụrụ, “Ọ bụ onye nʼime anyị ka ị chọrọ izi ozi?” Ọ zara, “Ọ bụ gị ọchịagha.”
2KI 9:6 Jehu biliri baa nʼime ụlọ. Nwokorobịa onye amụma ahụ wụkwasịrị ya mmanụ nʼisi, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Eteela m gị mmanụ ịbụ eze ndị nke Onyenwe anyị, bụ Izrel.
2KI 9:7 Ị ga-ekpochapụ ezinaụlọ Ehab, nna gị ukwu, aga m esi otu a bọtara onwe m ọbọ, nʼihi ọbara ndị ohu m, bụ ndị amụma na ọbara ndị ozi Onyenwe anyị niile Jezebel wufuru.
2KI 9:8 Ezinaụlọ Ehab ga-abụ ihe lara nʼiyi. Nʼala Izrel, m ga-esite nʼezinaụlọ Ehab bipụ ndị ikom niile, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya.
2KI 9:9 M ga-ala ụlọ Ehab nʼiyi, ka m si laa ezinaụlọ Jeroboam nwa Nebat nʼiyi, na dịka m si lakwaa ezinaụlọ Baasha, nwa Ahija nʼiyi.
2KI 9:10 Nkịta ga-erikwa anụ Jezebel nwunye Ehab na Jezril. Ọ dịkwaghị onye ga-eli ya.’ ” Mgbe o kwuchara okwu ndị a, onye amụma ahụ meghere ụzọ gbapụ ọsọ.
2KI 9:11 Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?” Jehu zara, “Unu maara onye ọ bụ, marakwa ụdị okwu ga-esi ya nʼọnụ pụta.”
2KI 9:12 Ha sịrị, “Ihe i kwuru abụghị eziokwu, gwa anyị ihe o kwuru.” Jehu sịrị, “Ihe ndị a ka ọ gwara m, ‘Otu a ka a Onyenwe anyị kwuru, Eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ ”
2KI 9:13 Ngwangwa ha chịịrị uwe mgbokwasị ha niile doo ha nʼusoro nʼala ebe ahụ ka Jehu zọkwasị ha ụkwụ. Ha fụrụ opi ike tie mkpu sị, “Jehu bụ eze!”
2KI 9:14 Otu a ka Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi, si gbaa izu megide Joram. (Nʼoge a, Joram na ndị Izrel niile na-eche Ramọt Gilead nche, nʼihi Hazael eze Aram.)
2KI 9:15 Ma Joram bụ eze, laghachitere na Jezril ebe ọ nọ ka ahụ dị ya mma maka ahụ ndị Aram merụrụ ya mgbe ya na Hazael, eze Aram lụrụ agha. Ya mere, Jehu sịrị, “Ọ bụrụ na nke a bụ uche unu, ime m eze unu, unu ekwela ka onye ọbụla si nʼobodo a gbapụ, gaa Jezril kọọ akụkọ a.”
2KI 9:16 Mgbe ahụ, Jehu wụkwasịrị nʼelu ụgbọ agha ya gbaga Jezril, nʼihi na Joram nọ nʼebe ahụ na-ezu ike. Ma Ahazaya, bụ eze Juda gakwara ileta ya.
2KI 9:17 Mgbe onye nche nọ nʼụlọ elu Jezril hụrụ Jehu na ndị agha ya ka ha na-abịa, o tiri mkpu sị, “Lee, o nwere ndị agha na-abịa.” Joram eze Izrel nyere iwu sị, “Zipụ otu onye na-agba ịnyịnya ka ọ gaa zute ha jụọ ha sị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ”
2KI 9:18 Onye ọgbaịnyịnya ahụ nọkwasịrị nʼelu ya gbapụ izute Jehu, sị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ” Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Tụgharịa gaa soro m nʼazụ.” Onye nche ahụ ziri ozi sị, “Onyeozi ahụ ezutela ha, kama ọ naghị alọta.”
2KI 9:19 Eze zipụrụ onye ọgbaịnyịnya nke abụọ. Mgbe ọ bịakwutere ha ọ sịrị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ” Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Chigharịa soro m nʼazụ.”
2KI 9:20 Onye ahụ nọ na-eche nche sịrị, “Ọ garuola ha nso, ma ọ dịghị alọghachitekwa azụ. Ma ọgbụgba ịnyịnya dịka ọ bụ Jehu nwa Nimshi, nʼihi na ọ na-agba ịnyịnya ya dịka onye na-ayị ara.”
2KI 9:21 Joram nyere iwu sị, “Kwadooro m ụgbọ agha m.” Mgbe a kwadooro ya, Joram eze Izrel, na Ahazaya, eze Juda, pụtara nọkwasị nʼụgbọ agha, onye ọbụla na nke ya, pụọ ịga izute Jehu. Ha zutere ya nʼoke ala ubi Nebọt, onye Jezril.
2KI 9:22 Mgbe Joram hụrụ Jehu, ọ jụrụ, “Ị bịara nʼudo? Udo ọ dịkwa, Jehu?” Jehu zara, “Olee otu udo ga-esi dịrị, ebe ọ bụ na ihe ọjọọ niile nke ikpere arụsị na mgbaasị nke Jezebel nne gị, jupụtara nʼebe niile.”
2KI 9:23 Joram chigharịrị ụgbọ agha ya bido ịgba ọsọ. Mgbe ọ na-agba ọsọ, o tiri mkpu kpọkuo Ahazaya sị ya, “Ahazaya, Aghụghọ dị, ọgbaaghara dị!”
2KI 9:24 Jehu jiri ike ya niile dọtịa ụta o ji nʼaka ya gba ya Joram. Ọ gbatara Joram àkụ ahụ nʼazụ. Àkụ ahụ sikwa ya nʼobi pụta. Nke a mere ka Joram daa nʼime ụgbọala ya nwụọ.
2KI 9:25 Mgbe ahụ, Jehu sịrị Bidka, bụ onyeisi agha ya, “Bulie ya, tụba ya nʼubi Nebọt onye Jezril. Chetakwa na mụ na gị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya, anyị abụọ, na-eso nna ya Ehab, mgbe Onyenwe anyị kwuru okwu amụma a megide ya.
2KI 9:26 ‘Nʼezie, ahụrụ m ọbara Nebọt na ọbara ụmụ ya ndị ikom ụnyaahụ, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼihi ya, aghaghị m ime ka ị kwụghachi ụgwọ ọbara ha nʼala ubi a.’ Ugbu a, bulie ya tụba ya nʼala ubi a dị ka okwu Onyenwe anyị si dị.”
2KI 9:27 Mgbe Ahazaya eze Juda, hụrụ ihe mere, ọ gbaara ọsọ na-agbago nʼụzọ Bet Hagan. Ma Jehu chụsoro ya, na-eti mkpu sị, “Gbukwuonụ ya.” Ha merụrụ ya ahụ ka ọ nọ nʼụgbọ agha ya, nʼụzọ ịga Gua, nso Ibleam, ọ gbara ọsọ ga Megido ebe ọ nọ nwụọ.
2KI 9:28 Ndị ohu ya ji ụgbọ agha bịa buru ozu ya bubata ya na Jerusalem, lie ya nʼebe e liri nna nna ya ha, nʼobodo Devid.
2KI 9:29 Nʼafọ iri na otu nke ọchịchị Joram nwa Ehab, ka Ahazaya malitere ịbụ eze Juda.
2KI 9:30 Mgbe Jezebel nụrụ na Jehu abịaruola Jezril, ọ banyere nʼụlọ ya, tee uri nʼanya abụọ, dozie agịrị isi ya, pụta bịa nọdụ ala nʼakụkụ oghereikuku, site nʼebe ahụ na-elepụ anya nʼezi.
2KI 9:31 Mgbe Jehu batara nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze, Jezebel kpọkuru ya sị, “Ị bịara nʼudo, gị Zimri, gị onye gburu nna gị ukwu.”
2KI 9:32 Jehu leliri anya elu lee anya na oghereikuku tie mkpu sị, “Onye dịnyeere m?” Onozi abụọ maọbụ atọ na-eje ozi nʼụlọeze lepụtara anya lee ya anya.
2KI 9:33 Jehu nyere ha iwu sị ha, “Tụdanụ ya nʼala.” Ya mere, ha si nʼelu ebe ahụ tụda ya nʼala. Mgbe ọ daruru ala, ọbara ya fesasịrị nʼahụ mgbidi ụlọ na nʼahụ ịnyịnya ndị ji ụkwụ ha zọjaa ya.
2KI 9:34 Jehu banyere nọ nʼime ụlọeze rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ. Emesịa, o nyere iwu sị, “Leenụ nwanyị a a bụrụ ọnụ; burunu ya gaa lie ya, nʼihi na ọ bụ ada eze.”
2KI 9:35 Mgbe ha pụtara ili ya, ọ bụ naanị okpokoro isi ya na ọkpụkpụ ụkwụ ya abụọ, na aka ya abụọ ka ha hụrụ. Ha ahụkwaghị anụ ahụ ya.
2KI 9:36 Ha laghachiri gwa Jehu ihe ha hụrụ. Ọ zara sị ha, “Nke a bụ okwu Onyenwe anyị, nke o kwuru site nʼọnụ ohu ya Ịlaịja onye Tishbe sị: ‘Nʼala ubi dị na Jezril ka nkịta ga-anọ rie anụ ahụ Jezebel.
2KI 9:37 Ozu Jezebel ga-adị ka unyi nʼala ubi dị na Jezril, ruo na mmadụ enweghị ike ikwupụta sị, Nke a bụ Jezebel.’ ”
2KI 10:1 Ugbu a, e nwere ụmụ Ehab ndị ikom ọnụọgụgụ ha dị iri asaa ndị nọ na Sameria, Jehu dere akwụkwọ ozi ziga Sameria, zigara ndịisi obodo Jezril, zigakwara ndị okenye na ndị na-elekọta ụmụ Ehab ndị ahụ. Ọ sịrị,
2KI 10:2 “Ugbu a, mgbe akwụkwọ a rutere unu aka, ebe unu na ụmụ ndị ikom nna unu ukwu nọ, ebe unu nwekwara ụgbọ agha na ịnyịnya, na obodo e wusiri ike na ngwa agha,
2KI 10:3 họpụtanụ onye kachasị inwe ugwu ma kwesikwa nʼime ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, mee ka ọ nọkwasị nʼocheeze nna ya. Mgbe ahụ, buo agha chebe ụlọ nna unu ukwu.”
2KI 10:4 Ma ha tụrụ egwu nʼebe ọ dị ukwuu, sị, “Lee, eze abụọ enweghị ike iguzogide ya, anyị onwe anyị ga-esi aṅaa guzogide ya?”
2KI 10:5 Ya mere, onye ọ dị nʼaka ilekọta ezinaụlọ eze, onyeisi obodo, ndị okenye na ndị niile na-elekọta ụmụ Ehab, dere akwụkwọ a zigara Jehu, sị ya, “Jehu, anyị niile bụ ndị ohu gị. Anyị jikeere ime ihe niile i gwara anyị. Anyị agaghị ahọpụta onye ọbụla dịka eze; gị onwe gị mee ihe ọbụla ị chere na ọ bụ ya kachasị mma.”
2KI 10:6 Mgbe ahụ, Jehu degaara ha akwụkwọ nke ugboro abụọ sị ha, “Ọ bụrụ na unu dịnyeere m, ọ bụrụkwa na unu ga-erube isi nye m, chịrịnụ isi ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, bịakwute m nʼotu oge a echi na Jezril.” Nʼoge ahụ, ụmụ eze iri ndị ikom asaa nọ nʼaka ndịisi obodo ahụ, ndị na-azụlite ha.
2KI 10:7 Mgbe akwụkwọ ozi ahụ rutere ha, ndị ikom ahụ kpọrọ ụmụ ndị ikom eze dị iri asaa nʼọnụọgụgụ gbuo ha niile, chịrị isi ha tinye na nkata zigara ya Jehu na Jezril.
2KI 10:8 Mgbe onyeozi bịarutere, ọ gwara Jehu sị, “Ha ebutala isi ụmụ ndị ikom eze.” Mgbe ahụ, Jehu nyere iwu sị, “Tụkọbanụ ha ọnụ nʼoke abụọ, nʼọnụ ụzọ e si abata obodo, tutu ruo ụtụtụ.”
2KI 10:9 Nʼụtụtụ ya, Jehu pụrụ, guzoro nʼihu ndị niile gbakọrọ nʼebe ahụ gwa ha okwu sị, “Ndị Izrel, unu bụ ndị ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m gbara izu ọjọọ megide nna m ukwu, gbuo ya, ma onye gburu ndị a niile?
2KI 10:10 Matanụ nke ọma na o nweghị okwu ọbụla Onyenwe anyị kwuru megide ezinaụlọ Ehab nke na-agaghị emezu. Onyenwe anyị emeela ihe o kwere nkwa na ọ ga-eme site nʼọnụ ohu ya Ịlaịja.”
2KI 10:11 Emesịa, Jehu gburu ndị ikwu Ehab fọdụrụ nʼobodo Jezril, ha na ndịisi niile, na ndị enyi ya niile, na ndị nchụaja ya niile. Ọ dịkwaghị otu onye ikwu Ehab ọ hapụrụ ndụ.
2KI 10:12 Emesịakwa, Jehu hapụrụ Jezril gaa Sameria. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe a na-akpọ Ebe Izuike Ndị ọzụzụ atụrụ.
2KI 10:13 Nʼebe ahụ, o zutere ndị ụmụnna Ahazaya, eze Juda, jụọ sị, “Olee ndị ka unu bụ?” Ha zara, “Anyị bụ ndị ikwu Ahazaya, eze Juda, anyị bịara ka anyị jụọ maka ọdịmma ndị ezinaụlọ eze na nne eze.”
2KI 10:14 O nyere iwu sị, “Jidenụ ha na ndụ.” Ha jidere ha na ndụ, gbukwaa ha niile nʼakụkụ olulu miri nke Bet-Eked. Ọnụọgụgụ ha dị iri anọ na abụọ. O nweghị onye ọbụla ọ hapụrụ ndụ.
2KI 10:15 Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o zutere Jehonadab nwa Rekab, ka ọ na-abịa izute ya. Jehu kelere ya, sị, “Obi gị, o ziri ezi nwee nkwekọrịta, dịka obi m dị nʼebe ị nọ?” Jehonadab zara sị ya, “E.” Jehu sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, kwe m nʼaka.” Jehonadab kwere ya nʼaka. Jehu nʼonwe ya nyeere ya aka ka ọ rigota nʼụgbọ agha ya.
2KI 10:16 Mgbe ahụ, Jehu sịrị ya, “Ugbu a, soro m bịa lee ụdị ịnụ ọkụ nʼobi m nwere maka ọrụ Onyenwe anyị.” Ha abụọ sooro nʼụgbọ agha Jehu.
2KI 10:17 Mgbe ha bịaruru Sameria, Jehu gburu ndị enyi na ndị ikwu Ehab niile, ndị fọdụrụ site nʼikwu Ehab, o bibiri ha dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma Ịlaịja.
2KI 10:18 Emesịa, Jehu kpọkọtara ndị obodo ahụ niile sị ha, “Ehab fere Baal ofufe nke nta, Jehu ga-efe ya ebe ọ dị ukwuu.
2KI 10:19 Ugbu a, kpọkọtaanụ ndị amụma Baal niile, ndị niile na-efe ya, na ndị nchụaja ya niile. Hụnụ na onye ọbụla nʼime ha bịara, nʼihi na a ga-eme oke mmemme ịchụ aja nye Baal. Onye ọbụla e lere anya ya nʼebe ahụ, ma a hụghị ya, agaghị adị ndụ.” Ma Jehu ji aghụghọ nʼihi ka ọ laa ndị a na-efe Baal nʼiyi.
2KI 10:20 Jehu sịrị, “Kpọsaanụ na a ga-enwe oke mkpọkọta dị nsọ nye Baal.” Ya mere, ha kwusara ya.
2KI 10:21 O zipụrụ ozi nye ndị bi nʼakụkụ Izrel niile. Ndị niile na-efe Baal bịazuru. Ọ dịghị onye fọdụrụ nke na-abịaghị. Ha jupụtara nʼụlọnsọ ukwu Baal site nʼotu isi ya ruo nʼisi nke ọzọ.
2KI 10:22 Jehu sịrị onye na-elekọta ụlọ ebe a na-edebe uwe ndị na-efe ofufe na-eyi, “Chịpụta uwe nye ndị niile na-efe Baal.” Ya mere, ọ chịpụtaara ha uwe.
2KI 10:23 Mgbe ahụ, Jehu na Jehonadab nwa Rekab, banyere nʼebe nzukọ Baal. Jehu sịrị ndị nʼefe Baal, “Chọzienụ nke ọma ka unu hụ na o nweghị onye ọbụla na-efe Onyenwe anyị nọ nʼebe a, karịakwa naanị ndị na-efe Baal.”
2KI 10:24 Mgbe ha malitere ịchụ aja na isure ihe nsure ọkụ, Jehu emeelarị ka iri ndị agha asatọ gbaa ụlọ ahụ niile gburugburu. O nyelarị iwu sị, “Ọ bụrụ na unu ekwere ka otu onye si nʼime ụlọ a gbapụ, unu ga-eji ndụ unu kwụghachi ụgwọ onye dị otu ahụ.”
2KI 10:25 Ngwangwa Jehu chụchasịrị aja nsure ọkụ, ọ pụrụ gwa ndị agha ya, na ndịisi ha okwu sị, “Baanụ nʼime ụlọ gbuo ndị niile nọ nʼebe ahụ. Unu ekwela ka otu onye nʼime ha gbapụ.” Ha jiri mma agha gbuo ndị ahụ nọ nʼime ụlọ Baal, tụpụta ozu ha nʼezi. Emesịa, ndị agha Jehu banyere nʼime ime ụlọ ebe ịchụ aja Baal,
2KI 10:26 ha bupụtara ogidi nsọ e ji efe Baal, kpọọ ha ọkụ.
2KI 10:27 Ha kwaturu ogidi nsọ Baal, kwatukwaa ụlọ ịchụ aja ya. Ya mere e megharịrị ya ka ọ bụrụ ebe ọha mmadụ na-aga ogwe ruo taa.
2KI 10:28 Jehu kpochapụrụ ofufe Baal nʼala Izrel niile.
2KI 10:29 Ma otu ọ dị, o siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya. Mmehie nke Jeroboam mere ka Izrel mehie, ya bụ, mmehie nke ife arụsị ụmụ ehi e ji ọlaedo kpụọ, dị na Betel na Dan.
2KI 10:30 Onyenwe anyị gwara Jehu sị, “Nʼihi na i mere nke ọma mezuo ihe niile ziri ezi nʼanya m, nʼebe ezinaụlọ Ehab nọ, nʼusoro ihe niile dị nʼuche m ime, ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel, ruo nʼọgbọ nke anọ ha.”
2KI 10:31 Ma Jehu akpachapụghị anya iji obi ya niile debe iwu Onyenwe anyị, Chineke Izrel. O siteghị na mmehie Jeroboam wezuga onwe ya, bụ mmehie ahụ o mere ka Izrel mee.
2KI 10:32 Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị malitere ime ka ndị Izrel bido ịdị nta. Hazael eze Aram, buru agha merie ọtụtụ akụkụ Izrel,
2KI 10:33 nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ala niile nke Gilead (nʼoke ala ndị Gad, na nke ndị Ruben, na Manase), site nʼAroea nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, ruo Gilead na Bashan.
2KI 10:34 Akụkọ gbasara ọchịchị eze Jehu, na ihe niile o mere, na ịkpa ike ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel?
2KI 10:35 Jehu sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya bụ Jehoahaz nọchiri anya ya dịka eze.
2KI 10:36 Ma ụbọchị niile Jehu bụ eze Izrel nʼime Sameria dị iri afọ abụọ na asatọ.
2KI 11:1 Mgbe Atalaya nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze.
2KI 11:2 Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, ma bụrụkwa nwanne nwanyị Ahazaya, kuuru Joash nwa Ahazaya, zopu ya site nʼetiti ụmụ ndị ikom eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina, ka Atalaya hapụ ịhụ ya, nke a mere na-egbughị ya.
2KI 11:3 Ya na nwanyị na-elekọta ya anya nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ.
2KI 11:4 Nʼafọ nke asaa, Jehoiada, ziri ozi kpọọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị Karị na ndị nche oku, mee ka ha bịakwute ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya na ha gbara ndụ, o mekwara ka ha ṅụọ iyi nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, o gosiri ha nwa eze.
2KI 11:5 O nyere ha iwu, sị, “Nke a bụ ihe unu ga-eme, unu bụ ndị nọ nʼotu atọ ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike, nke otu ụzọ nʼime unu na-eche ụlọeze nche,
2KI 11:6 otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Sua, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ ama, nʼazụ ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwu Chineke.
2KI 11:7 Ma unu bụ otu abụọ ndị kwesiri ịga ezumike site nʼọrụ unu nʼụbọchị izuike, ga-eguzo na nche nʼụlọnsọ ukwu nʼihi eze.
2KI 11:8 Doonụ onwe unu gburugburu eze, onye ọbụla nʼime unu jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla nke na-abịa nso ahịrị unu, ka e gbuo ya. Nọrọnụ eze nso ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.”
2KI 11:9 Ndị ọchịagha ndị a na-achị narị ndị agha mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-emechi ọrụ, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike, bịakwute Jehoiada, bụ onye nchụaja.
2KI 11:10 O nyere ndị ọchịagha ahụ ùbe na ọta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, ndị dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2KI 11:11 Onye ọbụla na ndị nche ahụ ji ngwa agha nʼaka ya, ha guzoro onwe ha, nọdụ eze gburugburu, na nso ebe ịchụ aja na ụlọnsọ ukwu, site nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ.
2KI 11:12 Jehoiada kpọpụtara nwa eze, kpube ya okpueze nʼisi, o nyere ya otu akwụkwọ nke ihe ọgbụgba ndụ ahụ, chie ya eze. Ha tekwara ya mmanụ ịbụ eze. Ndị niile nọ nʼebe ahụ kụrụ aka, tie mkpu, sị, “Ka eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!”
2KI 11:13 Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ nke ndị nche na ndị mmadụ na-eme, ọ gakwuru ndị ahụ nọ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2KI 11:14 O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi, dịka omenaala mmemme ịchị eze si dị. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze. Ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!”
2KI 11:15 Jehoiada, bụ onye nchụaja nyere ndịisi ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, iwu sị ha, “Sitenụ nʼebe ahụ kpọpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Agaghị egbu ya nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.”
2KI 11:16 Ya mere, ha jidere ya, mgbe o rutere nʼụzọ ebe ịnyịnya si abata nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha nọ gbuo ya.
2KI 11:17 Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na eze, na ndị mmadụ, na ha ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị. O mekwara ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti eze na ndị ahụ.
2KI 11:18 Ndị niile nke ala ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ mee ka ọ darisịa, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ. Mgbe ahụ, Jehoiada onye nchụaja, debekwara ndị nche ka ha lekọta ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2KI 11:19 Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ha na ndị Karị, na ndị nche, ha na ndị ala ahụ niile, ha niile dupụtara eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị site nʼọnụ ụzọ ndị nche banye nʼụlọeze. Eze were ọnọdụ ya nʼelu ocheeze.
2KI 11:20 Ndị ala ahụ niile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, obodo ahụ dakwara jụụ, nʼihi na e ji mma agha gbuo Atalaya nʼụlọeze.
2KI 11:21 Joash gbara afọ asaa mgbe ọ malitere ịbụ eze.
2KI 12:1 Nʼafọ nke asaa, nke ọchịchị Jehu nʼIzrel, ka Joash malitere ịbụ eze na Juda. Iri afọ anọ ka ọ chịrị dịka eze na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zibịa onye Bịasheba.
2KI 12:2 Joash mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị ụbọchị niile nke Jehoiada onye nchụaja ziri ya ihe.
2KI 12:3 Ma naanị na o wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị Juda nọgidere na-achụ aja dị iche iche nʼebe ahụ, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
2KI 12:4 Joash sịrị ndị nchụaja, “Nakọtaanụ ego niile a na-ewebata dịka onyinye dị nsọ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya bụ, ego a na-anakọta nʼoge ịgụ mmadụ ọnụ, na ego e webatara maka imezu nkwa ndị mmadụ kwere, na ego e webatara nʼụlọnsọ ukwu dịka onyinye afọ ofufe.
2KI 12:5 Ka onye nchụaja ọbụla site nʼaka otu nʼime ndị na-eche ego nara ego, a ga-eji mezie ihe ọbụla a chọpụtara na o mebiri nʼụlọnsọ ukwu ahụ.”
2KI 12:6 Ma nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze Joash, ọ chọpụtara na ndị nchụaja ahụ emezibeghị ihe mebiri nʼụlọnsọ.
2KI 12:7 Ya mere, eze Joash kpọrọ Jehoiada, onye nchụaja, kpọkwaa ndị nchụaja ndị ọzọ jụọ ha, “Gịnị mere unu emezibeghị ụlọnsọ a? Site ugbu a gaa nʼihu, unu esitekwala nʼaka ndị na-eche ego anara ego ọzọ, kama, nyefeenụ ya maka iji dozie ụlọnsọ ukwu ahụ.”
2KI 12:8 Ndị nchụaja ahụ kwenyere sị, “Anyị agaghị esitekwa nʼaka ndị mmadụ nara ego ọbụla. Otu a kwa, anyị agaghị emezikwa ụlọnsọ ukwu a nʼonwe anyị.”
2KI 12:9 Mgbe ahụ, Jehoiada wetara otu igbe mepuo oghere nʼelu ya, debe ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja, nʼaka nri dịka mmadụ na-abata nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ndị nchụaja niile na-eche nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ na-etinye ego niile e webatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼime igbe ahụ.
2KI 12:10 Mgbe ọbụla ha hụrụ na igbe ego ahụ ejupụtala nʼego, onye ode akwụkwọ ụlọeze na onyeisi nchụaja na-abịa, gụọ ego ahụ e webatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, tinye ha nʼakpa.
2KI 12:11 Ha na-ewere ego ahụ a gụrụ ọnụ, nyefee nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ndị ọrụ na-emezi ụlọ Onyenwe anyị. Ndị ahụ na-eji ya kwụọ ndị ọkwa ǹka osisi na ndị na-ewu ụlọ,
2KI 12:12 na ndị na-edo nkume, na ndị na-awa nkume ụgwọ. Ọ bụ sitekwa nʼego ahụ ka a na-azụta osisi na nkume a wara awa iji dozie ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ịkwụ ụgwọ ihe ndị ọzọ e ji emezi ihe niile ekwesiri imezi nʼụlọnsọ ukwu ahụ.
2KI 12:13 E jikwaghị ego ahụ e webatara nʼụlọnsọ kpụta efere ọlaọcha, ihe e ji akpakepụ ọkụ, efere ịkwọsa mmiri, opi maọbụ ihe ndị ọzọ nke e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha kpụọ maka ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
2KI 12:14 Ọ bụ ndị na-eje ozi, ndị ji ya rụzie ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ka e nyere ya.
2KI 12:15 O nweghị onye a sịrị ka ọ gụzie otu e si jiri ego ahụ rụọ ọrụ, bụ ndị e nyere ego ahụ maka ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ, nʼihi na ha bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi.
2KI 12:16 E webataghị ego niile sitere nʼaja ikpe ọmụma nakwa aja mmehie nʼime ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị. Ọ bụ ndị nchụaja nwe nke ahụ.
2KI 12:17 Nʼoge ahụ, Hazael eze Aram, gara buso Gat agha, lụgbuo ya, dọta ya nʼagha. Emesịa, o chere ihu nʼụzọ Jerusalem imegide ya.
2KI 12:18 Ma Joash, bụ eze Juda, chịkọtara ihe niile ahụ bụ nke Jehoshafat, Jehoram na Ahazaya nna ya, ndị bụ eze Juda doro nsọ nye Chineke, chịrịkwa onyinye nke ya onwe ya dokwara nsọ, na ọlaedo niile, na akụ niile e nwere ike ịchọta nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọeze, zigara Hazael, bụ eze Aram. Nʼihi ihe ndị a, ọ lara, hapụ ibuso Jerusalem agha.
2KI 12:19 Akụkọ gbasara ọchịchị eze Joash, na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Juda niile mere nʼoge ha.
2KI 12:20 Ndị ozi ya gbara izu ọjọọ megide Joash, gbukwaa ya na Bet Milo, nʼụzọ e si aga Sila.
2KI 12:21 Ndịisi ozi ahụ gburu ya bụ Jozabad nwa Shimeat, na Jehozabad nwa Shomea. Ọ nwụrụ, e lie ya na ndị nna nna ya ha nʼobodo Devid. Amazaya nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 13:1 Nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze Joash nwa Ahazaya na Juda, ka Jehoahaz nwa Jehu malitere ịbụ eze nʼIzrel nʼobodo Sameria. Ọ chịkwara na Sameria afọ iri na asaa.
2KI 13:2 Kama Jehoahaz bụ eze ọjọọ. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O soro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie.
2KI 13:3 Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu megide Izrel. O mere ka ha nọrọ nʼokpuru ọchịchị Hazael eze Aram na Ben-Hadad nwa ya ogologo oge.
2KI 13:4 Ma Jehoahaz kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị nʼoge a ka o nyere ya aka, Onyenwe anyị gere ya ntị, nʼihi na Chineke hụrụ mmegbu nke eze Aram na-emegbu ndị Izrel.
2KI 13:5 Onyenwe anyị họpụtaara Izrel onye nzọpụta, ha sitere nʼaka ike ndị Aram nwere onwe ha. Izrel biri nʼụlọ nke aka ha dịka ha biiri nʼoge gara aga.
2KI 13:6 Ma ha esighị na mmehie niile nke ụlọ Jeroboam wezuga onwe ha, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie, kama ha nọ na-ejegharị nʼime ha. Ọzọkwa, ogidi Ashera ka guzoro na Sameria.
2KI 13:7 Ọ dịghị ihe fọdụrụ na ndị agha Jehoahaz ma ọ bụghị naanị iri ndị agha ise na-agba ịnyịnya, na ụgbọ agha iri, na puku ndị agha iri. Nʼihi na eze Aram alaala ndị nke fọdụrụ nʼiyi, meekwa ka ha dịrị ka uzuzu mgbe a na-azọcha mkpụrụ.
2KI 13:8 Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoahaz, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
2KI 13:9 Jehoahaz sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya Jehoash nọchiri anya ya.
2KI 13:10 Nʼafọ iri atọ na asaa nke ịbụ eze Joash na Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ị bụ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị afọ iri na isii.
2KI 13:11 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, mmehie nke Jeroboam dubara Izrel ime. Jehoash nọgidere nʼime ha.
2KI 13:12 Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha o buru megide Amazaya eze Juda, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
2KI 13:13 Jehoash soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Jeroboam anọchie nʼocheeze ya. E liri Jehoash na Sameria, nʼebe e liri ndị eze Izrel ndị ibe ya.
2KI 13:14 Nʼoge a, Ịlaisha nọ nʼọrịa nke ọ ga-esite na ya anwụ. Jehoash, bụ eze Izrel gara ịhụ ya, ọ kwara akwa mgbe ọ hụrụ ya sị, “Nna m, nna m, usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!”
2KI 13:15 Ịlaisha gwara ya okwu sị, “Wepụta ụta na àkụ ụfọdụ.” O mere dịka Ịlaisha gwara ya.
2KI 13:16 Ịlaisha gwakwara eze Izrel okwu sị ya, “Jide ụta ahụ nʼaka gị abụọ.” Mgbe o jidere ụta ahụ Ịlaisha tụkwasịrị aka nke ya nʼaka eze.
2KI 13:17 Ịlaisha gwara ya sị, “Meghee oghereikuku ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ.” O meghere ya. Mgbe ahụ Ịlaisha gwara ya sị, “Gbapụ àkụ.” Eze gbapụrụ àkụ. Ịlaisha kwuru sị, “Àkụ mmeri Onyenwe anyị, àkụ mmeri megide Aram. Ị ga-ebibi ndị Aram kpamkpam nʼAfek.”
2KI 13:18 Ọ sịrị, “Chilite àkụ ndị ahụ,” ọ chilitere ha. Ịlaisha gwara eze Izrel, “Gbaa ha nʼala.” Ọ gbara ha nʼala ugboro atọ, ma kwụsị.
2KI 13:19 Ma onye nke Chineke ahụ were iwe sị ya, “Ị gaara apịa ya nʼala ugboro ise maọbụ isii. Mgbe ahụ, ị gaara enwe ike merie ndị Aram bibie ha kpamkpam. Ma ugbu a, ọ bụ naanị ugbo atọ ka ị ga-emeri ha.”
2KI 13:20 Ya mere, Ịlaisha nwụrụ. E likwara ya. Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-esi nʼala ndị Moab na-abịa nʼala Izrel izu ohi site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ọhụrụ ọbụla.
2KI 13:21 Otu ụbọchị, mgbe ụfọdụ ndị ikom na-eli otu nwoke nwụrụ anwụ, ha hụrụ ndị a na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Nʼihi nke a, ha mere ngwangwa site nʼụjọ tụbanye nwoke ahụ nʼili Ịlaisha. Mgbe ozu nwoke ahụ dara metụ ọkpụkpụ Ịlaisha ahụ, nwoke ahụ nwụrụ anwụ megharịrị ahụ bilie, guzo nʼụkwụ ya abụọ.
2KI 13:22 Hazael, eze Aram, busoro Izrel agha ụbọchị niile nke ndụ Jehoahaz eze Izrel.
2KI 13:23 Ma Onyenwe anyị meere ha amara, nwee ọmịiko nʼebe ha nọ, ma gosikwa ha na ihe banyere ha na-emetụ ya nʼobi nʼihi ọgbụgba ndụ ya na Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ruo taa, o kweghị ka e bibie ha, maọbụ ka e site nʼihu ya chụpụ ha.
2KI 13:24 Emesịa, Hazael eze Aram nwụrụ, Ben-Hadad nwa ya nọchikwara nʼọnọdụ ya.
2KI 13:25 Jehoash nwa Jehoahaz, weghachitere obodo niile nke ọ naara nʼaka nna ya Jehoahaz site nʼaka Ben-Hadad nwa Hazael. Ugboro atọ ka Jehoash meriri ya, site otu a weghachi obodo niile nke Izrel.
2KI 14:1 Nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoash nwa Jehoahaz nʼIzrel, ka Amazaya nwa Joash eze Juda malitere ọchịchị ya.
2KI 14:2 Amazaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ bụ eze na Jerusalem iri afọ abụọ na itoolu. Aha nne ya bụ Jehoadin, onye Jerusalem.
2KI 14:3 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ma o meghị dịka nna nna ya bụ Devid mere. Nʼihe niile, ọ gbasoro nzọ ụkwụ nna ya Joash.
2KI 14:4 Ọ wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị Juda gara nʼihu na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ahụ niile.
2KI 14:5 Mgbe alaeze ahụ siri ike nʼọchịchị ya, o gburu ndị ozi ahụ gburu eze, bụ nna ya.
2KI 14:6 Ma o meghị ka ụmụ ndị ogbu mmadụ ahụ nwụọ, nʼusoro ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis, ebe Onyenwe anyị nyere iwu sị: “Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.”
2KI 14:7 Amazaya bụ onye gburu puku ndị agha Edọm iri na Ndagwurugwu Nnu, dọtakwa obodo Sela nʼagha, gụgharịa ya Jekteel, nke bụ aha a na-akpọ ya ruo ụbọchị taa.
2KI 14:8 Mgbe ahụ, Amazaya zigara ndị ozi ka ha jekwuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jehu, eze Izrel, zie ya ozi ịma aka, sị, “Bịa, ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.”
2KI 14:9 Ma Jehoash eze Izrel zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda sị ya, “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi, sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ, zọpịa uke ahụ.
2KI 14:10 I meriela Edọm, nʼezie. Ugbu a, mpako abatala. Ṅụrịa ọṅụ nʼihi mmeri nke i nwetara, ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?”
2KI 14:11 Ma otu ọ dị, Amazaya egeghị ntị. Ya mere, Jehoash bụ eze Izrel buliri agha, ya na Amazaya eze Juda zutere ihu na ihu nʼagha na Bet-Shemesh, dị nʼala Juda.
2KI 14:12 Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya.
2KI 14:13 Jehoash bụ eze Izrel nwudere Amazaya bụ eze Juda, nwa Joash, nwa Ahazaya na Bet-Shemesh. Mgbe ahụ, Jehoash gara Jerusalem kwada mgbidi Jerusalem, site nʼỌnụ ụzọ ama Ifrem ruo nʼọnụ ụzọ ama Nkuku, nke ogologo ya ruru narị nzọ ụkwụ isii.
2KI 14:14 Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọakụ nke ụlọeze. Ọ dọtara ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria.
2KI 14:15 Ihe banyere akụkọ ndị ọzọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha ọ lụrụ megide Amazaya eze Juda, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
2KI 14:16 Jehoash sooro nna nna ya ha dinaa nʼọnwụ, e lie ya na Sameria, ebe e liri eze ndị Izrel ndị ọzọ. Jeroboam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 14:17 Amazaya nwa Joash, eze Juda nọrọ ndụ afọ iri na ise, mgbe Jehoash nwa Jehoahaz, eze Izrel nwụsịrị.
2KI 14:18 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amazaya, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
2KI 14:19 Ha gbara izuzu imegide ya nʼime Jerusalem, ọ gbapụrụ gbalaga Lakish. Ma ha zipụrụ ndị ikom chụụrụ ya gaa Lakish, gbuo ya nʼebe ahụ.
2KI 14:20 Ha bulatara ozu ya nʼelu ịnyịnya, e lie ya na Jerusalem nʼebe e liri ndị nna nna ya ha, nʼobodo Devid.
2KI 14:21 Mgbe ahụ, ndị Juda niile duuru Azaraya onye aha ya bụkwa Uzaya, onye gbara afọ iri na isii, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya Amazaya.
2KI 14:22 Ọ bụ ya wugharịrị obodo Elat, nyeghachi ya Juda, mgbe Amazaya eze sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ.
2KI 14:23 Nʼafọ nke iri na ise nke Amazaya nwa Joash, eze Juda, Jeroboam nwa Jehoash eze Izrel ghọrọ eze na Sameria. Ọ chịrị iri afọ anọ na otu dịka eze.
2KI 14:24 Ma o mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị nʼihi na o wezugaghị onwe ya site na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye ahụ dubara ndị Izrel na mmehie.
2KI 14:25 Ọ bụ ya weghachitara oke ala Izrel site na Lebo Hamat ruo nʼosimiri Araba, dịka okwu Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Jona nwa Amitai, onye amụma si Gat Hefa.
2KI 14:26 Onyenwe anyị hụrụ ọnọdụ ọjọọ nke ndị Izrel nọ nʼime ya; onye ọbụla nʼime ha, ohu na onye nwe onwe ya, nọ nʼoke ahụhụ. Ọ dịkwaghị onye inyeaka ọbụla ha nwere.
2KI 14:27 Ma ọ bụghị uche Onyenwe anyị ịla Izrel nʼiyi kpamkpam nʼokpuru eluigwe, nʼihi ya ka o mere ka Jeroboam nwa Jehoash napụta ha site nʼaka ndị iro ha.
2KI 14:28 Akụkọ niile gbasara ihe niile Jeroboam mere, na ike ya niile, na agha niile o buru, na otu o si nwetaghachiri ndị Izrel obodo Damaskọs na Hamat, bụ obodo ndị Juda, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha?
2KI 14:29 Jeroboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ndị eze Izrel nwụrụ anwụ. Ma Zekaraya nwa ya ghọrọ eze Izrel nʼọnọdụ ya.
2KI 15:1 Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Jeroboam nʼIzrel ka Azaraya nwa Amazaya bidoro ịchị dịka eze na Juda.
2KI 15:2 Ọ gbara afọ iri na isii mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịkwara na Jerusalem iri afọ ise na abụọ. Aha nne ya bụ Jekolaya, onye Jerusalem.
2KI 15:3 O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya, mee ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
2KI 15:4 Kama dịka eze ndị ọzọ, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu; ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ.
2KI 15:5 Onyenwe anyị tiri eze ihe otiti ọrịa ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche. Jotam nwa nwoke eze ghọrọ onye nlekọta ụlọeze na-achịkwa ndị ala ahụ.
2KI 15:6 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Azaraya, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
2KI 15:7 Azaraya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼebe e liri ha, nʼime obodo Devid. Jotam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 15:8 Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Azaraya bụ eze Juda, ka Zekaraya, nwa Jeroboam ghọrọ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị ọnwa isii.
2KI 15:9 Dịka ndị nna ya bu ya ụzọ si mee, Zekaraya mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O mekwara dịka Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie ịkpọ isiala nye chi ọzọ.
2KI 15:10 Shalum nwa Jebesh, na ndị ọzọ, gbara izu ọjọọ megide ya, tigbuo ya nʼihu ndị Izrel niile. Ọ ghọkwara eze mgbe Zekaraya nwụrụ.
2KI 15:11 Akụkọ metụtara ihe ndị ọzọ mere mgbe Zekaraya bụ eze, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha.
2KI 15:12 Ya mere, okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jehu mezuru, nke bụ: “Ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel ruo nʼọgbọ nke anọ ha.”
2KI 15:13 Shalum nwa Jebesh malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri atọ na itoolu nke ọchịchị Uzaya eze Juda. Ọ chịrị otu ọnwa na Sameria.
2KI 15:14 Menahem nwa Gadi sitere nʼobodo Tịaza bịaruo Sameria gbuo Shalum nwa Jebesh ghọọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 15:15 Akụkọ ndị ọzọ gbasara Shalum na izu ọjọọ ya, e deghị ha nʼakwụkwọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel na-achị.
2KI 15:16 Nʼoge ahụ, Menahem sitere na Tịaza buso obodo Tipsa agha, na onye ọbụla bi nʼobodo ahụ na gburugburu ya nʼihi na ha ekweghị emeghe ọnụ ụzọ ama ha. O tigburu Tifsa kwakọrọ ihe niile, bọwakwaa afọ ndị inyom niile dị ime.
2KI 15:17 Nʼafọ iri atọ na itoolu nke Azaraya, eze Juda, Menahem nwa Gadi ghọrọ eze ọhụrụ ndị Izrel. Ọ chịrị afọ iri dịka eze na Sameria.
2KI 15:18 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼoge ọchịchị ya, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o mere ka Izrel mehie.
2KI 15:19 Mgbe ahụ, Pul eze Asịrịa busoro ala ahụ agha. Menahem nyere ya otu puku talenti ọlaọcha, ime ka Pul kwagide ọchịchị ya, na ime ka aka ya siekwa ike nʼalaeze Izrel.
2KI 15:20 Menahem si nʼaka ndị Izrel nweta ego a. Onye ọgaranya ọbụla tụrụ iri shekel ọlaọcha ise nke e nyere eze Asịrịa. Mgbe eze Asịrịa natachara ọlaọcha ndị a, o si nʼala ahụ pụọ, ọ nọgidekwaghị nʼala ahụ.
2KI 15:21 Akụkọ banyere Menahem na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha?
2KI 15:22 Menahem sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Pekahaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 15:23 Nʼafọ nke iri ise, nke ọchịchị eze Azaraya na Juda, ka Pekahaya nwa Menahem bidoro ịchị dịka eze nʼIzrel. Afọ abụọ ka ọ chịrị nʼime Sameria.
2KI 15:24 Ma Pekahaya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O sighị na mmehie niile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie.
2KI 15:25 Ma Peka nwa Remalaya, otu nʼime ndịisi agha eze na iri ndị ikom ise ọzọ si Gilead gbara izu megide ya, gbuo ya nʼụlọeze dị nʼime Sameria. Ha gbukwara Agob na Arie nʼoge a ha gburu Pekahaya. Emesịa, Peka ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 15:26 Akụkọ banyere Pekahaya na ihe niile o mere ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha.
2KI 15:27 Nʼafọ nke iri ise na abụọ nke ọchịchị Azaraya eze Juda ka Peka nwa Remalaya ghọrọ eze Izrel nʼobodo Sameria. Ọ chịrị dịka eze iri afọ abụọ.
2KI 15:28 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O fere chi ọzọ ofufe, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ mmehie nke o dubara ndị Izrel nʼime ya.
2KI 15:29 Nʼoge Peka bụ eze Izrel, ka Tiglat-Pilesa, eze Asịrịa bịara were Ijon, Ebel-Bet-Maaka, Janoa, Kedesh, Hazọ, Gilead, Galili na ala ndị Naftalị niile. Ọ chụpụrụ ndị mmadụ niile mee ka ha gaa biri nʼAsịrịa.
2KI 15:30 Nʼoge ahụ, Hoshea nwa Elaa gbara izu ọjọọ megide Peka nwa Remalaya gbuo ya, bụrụ eze nʼọnọdụ ya. Ọ malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị eze Jotam nwa Uzaya.
2KI 15:31 Akụkọ banyere Peka na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel niile mere nʼụbọchị ndụ ha?
2KI 15:32 Nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị Peka nwa Remalaya eze Izrel ka Jotam nwa Ụzaya eze Juda malitere ọchịchị ya.
2KI 15:33 Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ ghọrọ eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem. Aha nne ya bụ Jerusha, nwa Zadọk.
2KI 15:34 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Ụzaya mere.
2KI 15:35 Kama, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu, ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ dị iche iche na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ. Jotam wugharịrị Ọnụ Ụzọ ama nke dị Elu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2KI 15:36 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile nke oge ọchịchị Jotam na ihe o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
2KI 15:37 (Nʼụbọchị ndị ahụ, Onyenwe anyị malitere izite Rezin eze ndị Aram na Peka nwa Remalaya, imegide ndị Juda.)
2KI 15:38 Jotam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ obodo nna ya. Ehaz nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 16:1 Ehaz nwa Jotam, malitere ịbụ eze Juda nʼafọ nke iri na asaa nke ọchịchị eze Peka nwa Remalaya eze Izrel.
2KI 16:2 Ehaz gbara iri afọ abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Afọ iri na isii ka ọ chịkwara nʼime Jerusalem, ma o meghị ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke ya, dịka nna ya Devid mere.
2KI 16:3 Ọ gbasoro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, ọbụladị i ji nwa ya nwoke chụọ aja nʼọkụ. Ọ gbasoro omenaala niile rụrụ arụ nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼihu ndị Izrel.
2KI 16:4 Ọ chụrụ aja surekwaa ihe nsure ọkụ aja na-esi isi ụtọ nʼebe niile dị elu, nʼelu ugwu niile, na nʼokpuru osisi ndụ ọbụla.
2KI 16:5 Mgbe ahụ, Rezin eze Aram na Peka nwa Remalaya, eze Izrel rigooro ịga buso Jerusalem agha, gbakwaa Ehaz gburugburu. Ma ha emerighị ya nʼagha.
2KI 16:6 Nʼoge ahụ, Rezin eze Aram dọtaghachiri obodo Elat nye onwe ya, site na ị chụpụ ndị Juda bi nʼElat. Ndị Edọm bara nʼobodo Elat, ha bikwa nʼebe ahụ ruo taa.
2KI 16:7 Ehaz zigara ndị ozi ka ha gaa zie Tiglat-Pilesa, eze ndị Asịrịa ozi, sị ya, “Abụ m ohu gị, onyenwe m ka ị bụ. Bịa napụta m site nʼaka eze ndị Aram na eze ndị Izrel, ndị na-ebuso m agha.”
2KI 16:8 Ehaz weere ọlaedo na ọlaọcha ahụtara nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na nke dị nʼakụ niile dị nʼụlọeze zigara eze Asịrịa dịka onyinye.
2KI 16:9 Eze ndị Asịrịa ṅara ya ntị site nʼibuso obodo Damaskọs agha na imeri ya. O gburu Rezin, bulaa mmadụ niile bi nʼime ya nʼike ka ha gaa biri nʼobodo Kia.
2KI 16:10 Mgbe eze Ehaz gara Damaskọs izute Tiglat-Pilesa bụ eze Asịrịa. Ọ hụrụ otu ebe nchụaja nke dị na Damaskọs. O zigaara Ụraya onye nchụaja oyiyi ebe ịchụ aja ahụ. O dekwara ihe gbasara ya nʼakwụkwọ, nke ga-akọwa otu e si ewu ya.
2KI 16:11 Ya mere, Ụraya onye nchụaja, wuru ebe ịchụ aja nke dị ka nke ahụ Ehaz hụrụ na Damaskọs. O wuchara ya tupu eze alọta.
2KI 16:12 Mgbe eze si Damaskọs lọta na Juda, ọ hụrụ ebe ịchụ aja ahụ, bịaruo ya nso, doo onyinye ịchụ aja ya nʼelu ya.
2KI 16:13 Ọ chụrụ aja nsure ọkụ, na aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na aja onyinye mkpụrụ ọka. Ọ wụkwasịrị onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, fesakwa ọbara aja udo ya niile nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.
2KI 16:14 O wepụrụ ebe ịchụ aja bronz nke dị nʼihu Onyenwe anyị, o sitere nʼebe ọ dị nʼihu ụlọnsọ ahụ, nʼetiti ebe ịchụ aja ọhụrụ na ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bute ya nʼakụkụ ugwu nke ebe ịchụ aja ọhụrụ ya.
2KI 16:15 Eze Ehaz nyere Ụraya, bụ onyeisi nchụaja iwu, sị, “Ọ bụ nʼelu ebe ịchụ aja ọhụrụ a ka ị ga na-esure aja nsure ọkụ ụtụtụ niile, na onyinye mkpụrụ ọka nke uhuruchi niile, na aja nsure ọkụ eze, na onyinye mkpụrụ ọka nke eze, na aja na onyinye nke ndị niile nʼala a, ya na onyinye mkpụrụ ọka ha niile na onyinye ihe ọṅụṅụ ha niile. Fekwasị ọbara niile e ji chụọ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. Ma ebe ịchụ aja ọla ahụ ga-adịrị m iji jụta ase.”
2KI 16:16 Ụraya onye nchụaja mere ihe niile dịka eze Ehaz nyere ya nʼiwu.
2KI 16:17 Eze bụ Ehaz wepụrụ ihe njikọ niile jikọrọ ihe ndọkwasị ahụ niile a na-ebugharị ebugharị. O wepụrụ efere ukwu ịdọba mmiri a dọkwasịrị nʼelu ehi ọla ahụ dị nʼokpuru ya, ma dọkwasị ya nʼelu nkume.
2KI 16:18 Nʼihi imekwa ka obi tọọ eze Asịrịa ụtọ, o wepụrụ ụzọ a na-esite maka ụbọchị izuike nke e wuru nʼime ụlọnsọ, na ụzọ mbata eze si abanye nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2KI 16:19 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ehaz, na ihe ndị o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
2KI 16:20 Ehaz soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Hezekaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 17:1 Nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Ehaz, bụ eze Juda, ka Hoshea nwa Elaa ghọrọ eze Izrel nʼobodo Sameria. Ọ chịrị dịka eze afọ itoolu.
2KI 17:2 O mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị mgbe ọ bụ eze. Ma ọ bụghị dịka ndị eze Izrel ndị ọzọ bu ya ụzọ.
2KI 17:3 Shalmanesa eze Asịrịa bịara buso Hoshea agha, nʼihi na Hoshea nọ nʼokpuru ọchịchị eze Asịrịa, bụrụkwa onye na-atụ ụtụ nye ya kwa afọ.
2KI 17:4 Ma eze Asịrịa chọpụtara na Hoshea abụghị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihi na Hoshea eze Izrel zipụrụ ndị ozi ya ka ha jekwuru So, eze Ijipt, maka enyemaka. Ọzọkwa, Hoshea kwụsịrị ịtụ ụtụ nye eze Asịrịa dịka ọ na-eme kwa afọ. Nʼihi ya Shalmanesa nwụchiri ya, tinye ya nʼụlọ mkpọrọ.
2KI 17:5 Eze Asịrịa wakporo ala ahụ niile nʼagha, gbagoo imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu, afọ atọ.
2KI 17:6 Nʼafọ itoolu nke ọchịchị Hoshea, eze Asịrịa dọtara Sameria nʼagha, dọkpụrụ ndị Izrel niile buga ha nʼala Asịrịa. O mere ka ha biri nʼobodo Hala, nʼime Gozan nke dị nʼosimiri Hoboa, na nʼime obodo ndị Midia.
2KI 17:7 Ihe ndị a niile mere nʼihi na ndị Izrel mehiere megide Onyenwe anyị, bụ Chineke ha, onye ahụ mere ka ha site nʼokpuru ike Fero, eze Ijipt pụta. Ha kpọrọ isiala nye chi ndị ọzọ
2KI 17:8 gbasoro omenaala niile nke ndị mba ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼala ha. Ha gbasokwara omenaala ọjọọ ndị ahụ niile ndị eze ha webatara.
2KI 17:9 Ndị Izrel mere ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị Chineke ha na-adịghị anabata na nzuzo. Ha wuru ebe ịchụ aja nye chi dị iche iche nʼobodo ha niile, e, nʼobodo ukwu ma nʼobodo nta ọbụla.
2KI 17:10 Ha manyeere onwe ha ogidi nkume, na ogidi chi Ashera nʼelu ugwu ọbụla, na nʼokpuru osisi ọbụla nwere ndo.
2KI 17:11 Ha chụrụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ọbụla dịka mba ndị naara ebi nʼala ahụ si eme, bụ ndị Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼala ha, mgbe Izrel bịara biri nʼebe ahụ. Ha mere ihe ọjọọ dị iche iche, nke mere ka iwe wee Onyenwe anyị nke ukwuu.
2KI 17:12 E, ha fere arụsị dị iche iche ofufe, lefuo anya na Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Unu emela ihe dị otu a.”
2KI 17:13 Mgbe niile ka Onyenwe anyị na-eziga ndị amụma ya, na ndị ọhụ ụzọ, ịdọ Izrel na Juda aka na ntị, sị ha, “Sitenụ nʼajọ ihe unu na-eme chegharịa. Debenụ iwu na ụkpụrụ m, dịka iwu ahụ niile m nyere nna unu ha ka ha debe si dị, nke m sikwa nʼọnụ ndị ozi m bụ ndị amụma nye unu.”
2KI 17:14 Ma ndị Izrel jụrụ ige ntị. Kama ha kpachara anya kwesie olu ha ike dịka nna nna ha mere, bụ ndị na-ekwenyeghị na Onyenwe anyị Chineke ha.
2KI 17:15 Ha jụrụ ụkpụrụ ya niile na ọgbụgba ndụ ya, nke ya na ndị bụ nna nna ha gbara na iwu nke ọ dọrọ ha aka na ntị ka ha debe. Ha gbasooro chi arụsị bụ ihe efu, ha onwe ha ghọkwara ihe efu. Ha ṅomiri mba dị iche iche ndị ahụ bi ha gburugburu, nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị nyere ha iwu sị, “Unu emela dịka ha.”
2KI 17:16 Ha jụrụ idebe iwu niile Onyenwe anyị Chineke ha nyere ha. Ha meere onwe ha ogidi arụsị Ashera, kpụọrọ onwe ha oyiyi ụmụ ehi abụọ. Ha kpọrọ isiala nye Baal, na anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando.
2KI 17:17 Ha jiri ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom chụọ aja nsure ọkụ nye chi ndị mba ọzọ. Ha gakwara nʼaja ịjụ ase, na ịgba aja, si otu a nyefee onwe ha nʼaka ime ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe.
2KI 17:18 Ya mere, Onyenwe anyị wesoro Izrel iwe nke ukwuu, wezuga ha site nʼihu ya. Ọ dịkwaghị onye o kwere ka ọ fọdụ, karịakwa naanị ebo Juda.
2KI 17:19 Ma ndị Juda jụkwara idebe ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke ha nyere ha nʼiwu. Ha sooro omume ọjọọ ndị Izrel webatara.
2KI 17:20 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị jụrụ ndị Izrel niile. Ọ tara ha ahụhụ site nʼinyefe ha nʼaka ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike tutu ruo mgbe o mere ka e site nʼihu ya wezuga ha.
2KI 17:21 Mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị Izrel dọwapụ onwe ha site nʼalaeze Devid, ha mere Jeroboam nwa Nebat, eze ha. Ma Jeroboam mere ka Izrel site nʼiso Onyenwe anyị wezuga onwe ha. O mere ka ha mee mmehie dị ukwuu.
2KI 17:22 Ọ dịkwaghị mgbe ụmụ Izrel sitere nʼime mmehie ahụ Jeroboam dubara ha pụta,
2KI 17:23 tutu ruo mgbe Onyenwe anyị kpochapụrụ Izrel niile site nʼihu ya, dịka o kwuru na ọ ga-eme, site nʼọnụ ndị amụma na-ejere ya ozi. Ọ bụ nke a mere ndị Izrel ji gaa biri nʼAsịrịa dịka ndị a dọtara nʼagha ruo taa.
2KI 17:24 Eze Asịrịa sitere nʼala Babilọn, Kuta, Ava, Hamat na Sefavaim kpọta ndị mmadụ bịara biri nʼobodo Sameria ịnọchi anya ndị Izrel niile e sitere nʼebe ahụ bupụ. Nʼụzọ dị otu a, ha nwetara Sameria birikwa nʼobodo ya niile.
2KI 17:25 Ma mgbe ndị Asịrịa malitere ibi nʼebe ahụ, ha atụghị egwu Onyenwe anyị, maọbụ fee ya ofufe. Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ọdụm ndị batara nʼetiti ha gbuo ụfọdụ mmadụ nʼime ha.
2KI 17:26 Ya mere, e zigara eze Asịrịa ozi sị ya, “Ndị ahụ i dọtara nʼagha mee ka ha bịa biri nʼobodo Sameria amaghị ihe chi nwe ala ahụ chọrọ. O zitere ọdụm nʼetiti ha, nke na-egbu ha, nʼihi na ndị ahụ amaghị ihe ọ chọrọ.”
2KI 17:27 Eze Asịrịa nyere iwu sị: “Ka otu onye nʼime ndị nchụaja e si na Sameria dọta nʼagha laghachi gaa biri nʼebe ahụ, izi ndị bi nʼobodo ahụ ihe chi ala ahụ chọrọ.”
2KI 17:28 Ya mere, otu nʼime ndị nchụaja ebuuru site na Sameria gaa ala ọzọ, bịara biri na Betel, kuziere ha otu ha ga-esi na-atụ egwu Onyenwe anyị.
2KI 17:29 Nʼagbanyeghị nke a, ndị mba ọbụla meere onwe ha chi nke aka ha nʼobodo ahụ niile ebe ha bi nʼime ya. Ha guzobere chi ndị a nʼụlọ arụsị nke ndị Sameria wuru nʼebe niile dị elu.
2KI 17:30 Ndị si Babilọn mere chi ha a na-akpọ Sukọt Benot; ndị si Kut emee Neagal, ebe ndị si Hamat mekwara Ashima.
2KI 17:31 Ndị si Ava mekwara Nibaz, na Tatak, ma ndị si Sefavaim na-esure ụmụ ha nʼọkụ dịka aja nye Adramelek na Anamelek, bụ chi ndị Sefavaim.
2KI 17:32 Ha tụrụ egwuOnyenwe anyị, ma ha họpụtara ụdị mmadụ dị iche iche site nʼetiti onwe ha, ndị na-ejere ha ozi dịka ndị nchụaja nʼụlọ chi ha dị nʼebe niile dị elu.
2KI 17:33 Ha na-atụ egwu Onyenwe anyị ma ha gara nʼihu na-efe chi nke aka ha dịka omenaala mba ebe ndị e si dọta ha nʼagha si dị.
2KI 17:34 Ruo taa, ha na-anọgidesi ike nʼife ofufe dịka ụzọ ochie ha si dị. Ha adịghị atụ egwu Onyenwe anyị, maọbụ mee dịka ụkpụrụ na iwu niile, maọbụ dịka ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu si dị, bụ nke Onyenwe anyị nyere ụmụ Jekọb, onye ọ kpọrọ Izrel.
2KI 17:35 Mgbe Onyenwe anyị na ndị Izrel gbara ndụ, o nyere ha iwu sị, “Unu atụkwala chi ọzọ ọbụla egwu, maọbụ kpọọ isiala nye ha. Unu efela ha ofufe maọbụ chụọ aja nye ha.
2KI 17:36 Ma Onyenwe anyị, onye ji ike dị ukwuu, na aka dị ike e setịpụrụ esetipụ kpọpụta unu site nʼala Ijipt, bụ naanị onye unu ga-atụ egwu. Ya ka unu ga-akpọ isiala nye, ya ka unu ga-achụrụ aja.
2KI 17:37 Unu ga-elezi anya hụ na unu debere ụkpụrụ na iwu niile, ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu ndị a e depụtara nʼakwụkwọ nye unu. Unu atụkwala egwu chi ndị ọzọ.
2KI 17:38 Unu echefula ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara. Unu akpọkwala isiala nye chi ndị ọzọ nʼihi egwu.
2KI 17:39 Kama, tụọnụ egwu ma fee Onyenwe anyị Chineke unu. Ọ bụ ya ga-anapụta unu site nʼaka ndị iro unu niile.”
2KI 17:40 Ma ndị Izrel egeghị ntị, kama, dịka ụzọ ọjọọ ha si dị, ha fere chi ọzọ ofufe.
2KI 17:41 Ọ bụ ezie na ndị a na-efe Onyenwe anyị ofufe, ma ha nọgidekwara na-ejere arụsị niile ha ozi. Ruo taa, ụmụ ha, na ụmụ ụmụ ha, gara nʼihu na-emekwa ihe nna nna ha mere.
2KI 18:1 Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Hoshea nwa Elaa eze Izrel ka Hezekaya nwa Ehaz eze Juda malitere ọchịchị nke ya.
2KI 18:2 Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Abija, ada Zekaraya.
2KI 18:3 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna nna ya Devid.
2KI 18:4 O wepụrụ ebe niile dị elu, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. O tipịakwara agwọ bronz ahụ Mosis mere, nʼihi na ruo nʼoge ahụ, ụmụ Izrel na-esure aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ya. (A kpọrọ ya Nehushtan.)
2KI 18:5 Hezekaya tụkwasịrị Onyenwe anyị, Chineke Izrel obi ya. Nʼezie, o nwekwaghị onye ọzọ dị ka ya nʼetiti ndị eze Juda niile, ndị bu ya ụzọ chịa, na ndị so ya.
2KI 18:6 Ọ gbasoro Onyenwe anyị nʼụzọ niile. O sitekwaghị nʼụzọ Onyenwe anyị wezuga onwe ya. O debere ihe niile Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
2KI 18:7 Onyenwe anyị nọnyeere ya nʼebe ọbụla ọ gara, ihe niile o mere gaara ya nke ọma. O nupuru isi jụ ịnọkwa nʼokpuru eze ndị Asịrịa, o fekwaghị ya ofufe.
2KI 18:8 O tigburu ndị Filistia nʼala ha niile ruo na Gaza, na obodo dị ya gburugburu. Ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, obodo ukwu niile e wusiri ike na obodo nta niile a na-ewusighị ike.
2KI 18:9 Nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Hezekaya, nke bụkwa afọ nke asaa nke ọchịchị Hoshea nwa Elaa, bụ eze Izrel, Shalmanesa, eze Asịrịa gbagoro imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu.
2KI 18:10 Mgbe afọ atọ gasịrị, nʼafọ nke isii nke ọchịchị Hezekaya, na afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshea, bụ eze Izrel, ndị agha Asịrịa dọtara Sameria nʼagha.
2KI 18:11 Ọ bụ nʼoge ahụ ka eze Asịrịa bupụrụ ndị Izrel niile bulaa ha Asịrịa nʼime obodo Hala, na Gozan nʼakụkụ iyi ukwu Hoboa, na nʼobodo ndị Midia.
2KI 18:12 Nke a mere nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼolu Onyenwe anyị bụ Chineke ha, jụkwa ime ihe ọ chọrọ ka ha mee. Ha edebeghị ọgbụgba ndụ ya na iwu niile Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha. Ha jụrụ ige ntị nʼiwu ndị a, maọbụ debe ha.
2KI 18:13 Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, merikwaa ha.
2KI 18:14 Mgbe ahụ, Hezekaya chọrọ ụzọ ọ ga-esi mee udo, zie ozi zigara eze Asịrịa nʼobodo Lakish sị ya, “Emehiela m, biko, site nʼala m pụọ. Aga m akwụ gị ihe ọbụla ị chọrọ nʼaka m.” Eze Asịrịa sitere nʼaka Hezekaya eze Juda nara narị talenti ọlaọcha atọ, na iri talenti ọlaedo atọ.
2KI 18:15 Hezekaya chịịrị ọlaọcha niile ọ chọtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na akụ niile dị nʼụlọeze, nye ya eze Asịrịa.
2KI 18:16 Nʼoge ahụ, Hezekaya bụ eze Juda, nyakapụtachara ọlaedo niile o ji techie ibo na ibo ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, chịrị ihe ndị a niile nye eze Asịrịa.
2KI 18:17 Eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha onye ọkwa ya kasị ukwuu, onyeisi ndị na-eje ozi na ọchịagha ya na usuu ndị agha ka ha jekwuru Hezekaya na Jerusalem. Ndị agha a bịaruru Jerusalem kwụsị nʼakụkụ olulu warawara e gwuru ebe Ọdọ mmiri dị elu si nʼasọfe, nʼụzọ e si aga obosara ala ndị na-asụ akwa.
2KI 18:18 Mgbe ha kpọrọ eze oku ka ọ bịa, Eliakịm nwa Hilkaya, onye nlekọta ụlọeze, na Shebna, ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ha.
2KI 18:19 Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ Hezekaya: “ ‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere?
2KI 18:20 Ị na-ekwu na i nwere ndụmọdụ na ike ibu agha, maọbụ naanị egbe ọnụ ka ị na-agba. Ọ bụ onye ka ị na-atụkwasị obi mere i ji enupu isi nʼokpuru m?
2KI 18:21 Lee, amatara m na ị na-atụkwasị obi nʼIjipt, mkpanaka achara ahụ gbajiri agbaji, nke na-adụwa aka onye ọbụla na-adabere na ya. Otu a ka Fero, eze Ijipt dị nye ndị niile na-atụkwasị ya obi.
2KI 18:22 Ma ọ bụrụ na unu asị m, “Anyị na-atụkwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị obi.” Ọ bụghị ya ka Hezekaya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, “Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼebe ịchụ aja dị nʼime Jerusalem?”
2KI 18:23 “ ‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha.
2KI 18:24 Ị ga-esi aṅaa jụ otu onyeisi nke dịkarịsịrị nta nʼime ndịisi ọrụ onyenwe m, na-agbanyeghịkwa na i na-atụkwasị obi nʼIjipt maka inweta ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya?
2KI 18:25 Tinyere nke a, abịara m ibuso ala a agha na ibibi ya ma enweghị okwu sitere na Chineke bịa? Ọ bụ Onyenwe anyị ya onwe ya gwara m ka m bilie megide obodo a, lakwaa ya nʼiyi.’ ”
2KI 18:26 Mgbe ahụ, Eliakịm nwa Hilkaya, Shebna na Joa sịrị ọchịagha ahụ, “Biko, gwa ndị ohu gị okwu nʼasụsụ Aramaik, ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ya. Agwala anyị okwu nʼasụsụ Hibru, ebe ndị nọ nʼelu mgbidi ga-anụ.”
2KI 18:27 Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?”
2KI 18:28 Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa.
2KI 18:29 Nke a bụ ihe eze sịrị, unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu site nʼaka m.
2KI 18:30 Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Onyenwe anyị obi. Mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, Onyenwe anyị aghaghị ịnapụta anyị, a gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’
2KI 18:31 “Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya:
2KI 18:32 ruo mgbe m ga-abịa duru unu gaa nʼala dịka nke unu, bụ ala mkpụrụ ọka na nke mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịnị, ala mmanụ aṅụ na osisi oliv jupụtara nʼime ya. Họrọnụ ndụ ka unu ghara ịnwụ. “Unu egela Hezekaya ntị, nʼihi na ọ bụ nrafu ka ọ na-arafu unu mgbe ọ na-asị, ‘Onyenwe anyị ga-anapụta anyị.’
2KI 18:33 O nwere chi mba ọbụla nke napụtara ha site nʼaka eze Asịrịa?
2KI 18:34 Olee ebe ka chi ndị Hamat na Apad nọ? Olee ebe ka chi ndị Sefavaim, Hena na Iva nọkwa? Ha anapụtala Sameria site nʼaka m?
2KI 18:35 Olee chi nʼime chi mba ndị a niile bụ nke zọpụtarala ala ya site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na Onyenwe anyị pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?”
2KI 18:36 Ma ndị ahụ niile gbara nkịtị, ha ekwughị ihe ọbụla, nʼihi na eze nyere ha iwu sị, “Unu azaghachila ya.”
2KI 18:37 Mgbe ahụ, Eliakịm nwa Hilkaya, onye na-elekọta ụlọeze, na Shebna ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf ode akwụkwọ, ha yi uwe ha dọwara adọwa, bịakwute Hezekaya gwa ya ihe niile onyeisi agha ahụ kwuru.
2KI 19:1 Mgbe eze Hezekaya, nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2KI 19:2 O zipụrụ Eliakịm onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ eze na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz.
2KI 19:3 Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, na ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya.
2KI 19:4 Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ niile nke Rabashaka bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.”
2KI 19:5 Mgbe ndị ozi eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya,
2KI 19:6 ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m.
2KI 19:7 Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ”
2KI 19:8 Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha.
2KI 19:9 Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Ya mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị,
2KI 19:10 “Gwanụ Hezekaya, eze Juda, Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’
2KI 19:11 Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị?
2KI 19:12 Chi niile nke mba niile ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden, ndị nọ na Tel Asa?
2KI 19:13 Olee ebe eze ndị Hamat maọbụ eze Apad nọ? Olee ebe eze obodo Lair, Sefavaim, Hena na Iva nọkwa?”
2KI 19:14 Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị.
2KI 19:15 Hezekaya kpere ekpere nye Onyenwe anyị, sị, “O, Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa.
2KI 19:16 Tọọ ntị gị nʼala, o Onyenwe anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ Onyenwe anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ.
2KI 19:17 “Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala mba niile a dị iche iche na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu.
2KI 19:18 Ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa.
2KI 19:19 Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị, naanị, bụ Chineke.”
2KI 19:20 Mgbe ahụ Aịzaya nwa Emọz zigaara Hezekaya ozi sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, Anụla m ekpere i kpere banyere Senakerib, eze Asịrịa.
2KI 19:21 Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị kwuru megide ya: “ ‘Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ Ada Zayọn na-elelị gị anya, ma jirikwa gị na-eme ihe ọchị. Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ
2KI 19:22 Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide Onye Nsọ nke Izrel?
2KI 19:23 I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, “Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ niile ya, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.
2KI 19:24 Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.”
2KI 19:25 “ ‘Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka m nọ pịa ọpịpịa ya; ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.
2KI 19:26 Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi na ome na-epupụta epupụta nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.
2KI 19:27 “ ‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ marakwa ọpụpụ gị na mbata gị marakwa oke iwe gị megide m.
2KI 19:28 Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’
2KI 19:29 “Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama, nye gị, Hezekaya: “Nʼafọ a unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe ubi si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi; kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.
2KI 19:30 Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.
2KI 19:31 Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta; otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. “Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-emezu nke a.
2KI 19:32 “Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa, sị, “ ‘Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a. Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya, maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya.
2KI 19:33 Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi; ọ gaghị abanye nʼobodo a. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
2KI 19:34 Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’ ”
2KI 19:35 Nʼabalị ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile.
2KI 19:36 Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive.
2KI 19:37 Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 20:1 Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma nwa Emọz bịakwutere ya sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”
2KI 20:2 Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ, kpee ekpere nye Onyenwe anyị, sị,
2KI 20:3 “Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.
2KI 20:4 Tupu Aịzaya esite nʼetiti ogige ụlọeze pụọ, okwu nke Onyenwe anyị rutere ya ntị, sị ya:
2KI 20:5 “Gaghachi azụ, gaa gwa Hezekaya, onye na-achị ndị m, ‘Otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke nna gị Devid, kwuru: Anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị, aga m agwọ gị. Aga m eme ka ahụ dị gị ike nʼụbọchị nke atọ site taa, mgbe ahụ ị ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2KI 20:6 Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị. Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a nʼihi mụ onwe m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’ ”
2KI 20:7 Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ.” Ha mere nke a, teekwasị ya nʼelu etuto ahụ, ahụ dịkwara ya mma.
2KI 20:8 Mgbe ahụ, Hezekaya jụrụ Aịzaya sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na Onyenwe anyị ga-agwọ m, na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nʼụbọchị nke atọ na-abịa nʼihu?”
2KI 20:9 Aịzaya zara, “Nke a bụ ihe ama Onyenwe anyị nye gị na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kwere na nkwa. Ị chọrọ ka onyinyo a gaa nʼihu ihe nrigo iri, ka ọ bụ ka ọ laa azụ ihe nrigo iri?”
2KI 20:10 Hezekaya zara sị, “Ọ dị mfe ka onyinyo gaa nʼihu nzọ ụkwụ iri. Ma mee ka onyinyo a laa azụ ihe nrigo iri.”
2KI 20:11 Mgbe ahụ, Aịzaya, onye amụma rịọrọ Onyenwe anyị ka o meere Hezekaya nke a. Onyenwe anyị mekwara ka onyinyo laghachi azụ ihe nrigo iri dịka o si gbada nʼihe nrigo ụlọ Ehaz.
2KI 20:12 Nʼoge ahụ, Merodak-Baladan, nwa Baladan, bụ eze Babilọn zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi ekele na onyinye, nʼihi na ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa.
2KI 20:13 Hezekaya nabatara ndị ozi ahụ gosi ha ihe niile dị nʼụlọakụ ya, ọlaọcha, na ọlaedo, ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ na ezigbo mmanụ oliv, ụlọ ebe ngwa agha ya niile dị, na ihe niile bụ akụ o nwere. Ọ dịghị ihe dị nʼụlọeze ya maọbụ nʼalaeze ya niile nke ọ na-egosighị ha.
2KI 20:14 Mgbe ahụ, Aịzaya onye amụma jekwuru eze Hezekaya jụọ ya sị, “Gịnị ka ndị ikom ndị ahụ kwuru? Ebeekwa ka ha si bịakwute gị?” Hezekaya zara sị, “Ọ bụ nʼala dị anya ka ha si, ha si Babilọn.”
2KI 20:15 Onye amụma jụrụ, “Gịnị ka ha hụrụ nʼụlọ gị?” Hezekaya zara sị, “Ihe niile nke dị nʼụlọ m ka ha hụrụ. Ọ dịghị ihe niile dị nʼụlọakụ m nke m na-egosighị ha.”
2KI 20:16 Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị Hezekaya, “Gee ntị nụrụ okwu Onyenwe anyị.
2KI 20:17 Lee, oge na-abịa mgbe a ga-eburu ihe niile dị nʼụlọeze gị, na ihe niile nke nna nna gị ha debere nʼụlọakụ ruo taa, buru ha bulaa Babilọn. Ọ dịkwaghị ihe ga-afọdụ, otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
2KI 20:18 A ga-ebupụ ụfọdụ nʼime ụmụ gị, ndị bụ ahụ na ọbara gị, ndị a ga-amụtara gị, buru ha pụọ nʼebe dị anya, ha ga-abụ ndị onozi nʼụlọeze nke eze Babilọn.”
2KI 20:19 Hezekaya zaghachiri, “Okwu Onyenwe anyị nke i kwuru dị mma.” Nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụ na udo na nchekwa agaghị adị nʼoge ndụ m?”
2KI 20:20 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, ọrụ niile ọ rụrụ, tinyere ọdọ mmiri o gwuru, na olulu ọwa mmiri na-aga o gwuru, nke o ji webata mmiri nʼime obodo, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
2KI 20:21 Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 21:1 Manase gbara afọ iri na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ ise na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Hefziba.
2KI 21:2 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, site nʼịgbaso ihe arụ niile nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na mbụ mere, bụ ndị Onyenwe anyị chụpụrụ nʼihu ndị Izrel.
2KI 21:3 O wugharịrị ebe dị elu niile nke nna ya Hezekaya lara nʼiyi. O wukwara ebe ịchụ aja dị iche iche nye Baal, pịakwa ogidi Ashera, dịka Ehab eze Izrel mere. Ọ kpọrọ isiala nye usuu ihe niile nke dị na mbara eluigwe, feekwa ha ofufe.
2KI 21:4 O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya sị, “Ọ bụ na Jerusalem ka m ga-etinye Aha m.”
2KI 21:5 O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe, nʼogige abụọ nke nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
2KI 21:6 O jikwa nwa ya nwoke chụọ aja nʼime ọkụ, ọ gbara aja, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe.
2KI 21:7 O were chi Ashera a pịrị apị, bụ nke o mere, debe nʼime ụlọnsọ ahụ, nke Onyenwe anyị gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu, sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi.
2KI 21:8 Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel wagharịa ọzọ site nʼala ahụ nke m nyere ndị nna nna ha, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu ma debekwa iwu niile nke ohu m bụ Mosis nyere ha.”
2KI 21:9 Ma ha egeghị ntị, Manase duhiere ha, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị Onyenwe anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel.
2KI 21:10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ ndị amụma ya, sị,
2KI 21:11 “Nʼihi na Manase, eze Juda emeela ihe arụ ndị a, o meela ihe dị njọ karịa nke ndị Amọrait, bụ ndị bụ ya ụzọ, o werela arụsị ya duba Juda nʼime mmehie.
2KI 21:12 Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, sịrị: Lee, ana m aga iweta mbibi dị ukwuu nke ga-adakwasị Jerusalem na Juda, nke ntị ọbụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru.
2KI 21:13 Aga m esetipụ eriri ịtụ ọtụtụ nke m ji megide Sameria na ihe ịtụ mgbidi nke m ji megide ụlọ Ehab, nʼelu Jerusalem. Aga m ehichapụ Jerusalem dịka mmadụ si ehichapụ efere, hichaa ya ihu na azụ ma kpuo ya ihu nʼala.
2KI 21:14 Aga m agbakụtakwa ndị fọdụrụ nʼihe nketa m azụ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha ga-aghọ ihe anaara nʼike, ghọọkwa ihe nkwata nʼagha nye ndị iro ha niile,
2KI 21:15 nʼihi na ha emeela ihe dị njọ nʼanya m, kpasukwaa m iwe, site nʼụbọchị nna nna ha si Ijipt pụta ọbụladị ruo taa.”
2KI 21:16 Nke ka nke, Manase gbukwara ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha, ruo na ọ wụsaara ọbara ha site nʼotu akụkụ Jerusalem ruo nʼakụkụ nke ọzọ ya, nke a agụnyeghị mmehie ahụ nke o dubara ndị Juda ime, nke mere ka ha mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
2KI 21:17 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ihe niile o mere, tinyere mmehie niile nke o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
2KI 21:18 Manase soro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼime ubi a gbara ogige nʼụlọeze ya, bụ ubi Ụza a gbara ogige. Amọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 21:19 Amọn gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ abụọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Meshulemet, ada Haruz onye Jotba.
2KI 21:20 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Manase mere.
2KI 21:21 Ọ gbasoro ụzọ ahụ niile dị iche nke nna ya gbasoro. O fere arụsị niile nke nna ya fere, kpọọkwa isiala nye ha.
2KI 21:22 Ọ jụrụ iso Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ya ha, jụkwa ibi ndụ irube isi nye ya.
2KI 21:23 Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu eze nʼime ụlọeze ya.
2KI 21:24 Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere Josaya nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya.
2KI 21:25 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amọn na ihe ndị o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
2KI 21:26 E liri ya nʼili nke aka ya, dị nʼogige Ụza. Josaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2KI 22:1 Afọ asatọ ka Josaya gbara mgbe ọ malitere ịbụ eze Juda. Iri afọ atọ na otu ka ọ chịrị na Jerusalem. Aha nne ya bụ Jedida, nwa Adaya onye Bozkat.
2KI 22:2 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, gbasookwa ụzọ niile nke nna nna ya Devid kpamkpam, o sighị nʼụzọ a wezuga onwe ya gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.
2KI 22:3 Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị ya, eze Josaya, zigara ode akwụkwọ bụ Shefan nwa Azalaya, onye bụkwa nwa nwa Meshulam, ka ọ gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ọ sịrị ya,
2KI 22:4 “Gakwuru Hilkaya onyeisi nchụaja, sị ya, gụkọta ego nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bụ nke ndị na-eche ọnụ ụzọ nakọtara site nʼaka ndị mmadụ.
2KI 22:5 Gwa ha ka ha nyefee ya nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ọrụ nʼụlọnsọ ahụ. Ka ndị ikom a kwụọ ndị ọrụ na-arụzi ụlọnsọ Onyenwe anyị ụgwọ ọrụ,
2KI 22:6 ya bụ, inye ya ndị ọkpọ ǹtu, ndị na-ewu ụlọ, na ndị na-edo nkume ụlọ. Ha jirikwa ego ahụ zụta osisi na nkume a wara awa, maka i ji dozie ụlọnsọ ahụ.
2KI 22:7 Ọ dịghị mkpa ka ha gụzie otu ha si mefuo ego nke e nyefere ha nʼaka, nʼihi na ọrụ ha egosila na ha kwesiri ntụkwasị obi.”
2KI 22:8 Hilkaya onyeisi nchụaja, sịrị Shefan ode akwụkwọ, “Achọtala m Akwụkwọ Iwu nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.” O nyere ya Shefan, onye nke gụkwara ya.
2KI 22:9 Mgbe ahụ, Shefan, bụ ode akwụkwọ, bịakwutere eze, gwa ya sị, “Ndị ozi gị enyefela ego niile nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼaka ndị ọrụ na nʼaka ndị nlekọta nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.”
2KI 22:10 Mgbe ahụ, Shefan bụ ode akwụkwọ, gwara eze sị, “O nwere akwụkwọ Hilkaya, onye nchụaja nyere m.” Shefan gụpụtara ihe dị nʼakwụkwọ a nʼihu eze.
2KI 22:11 Mgbe eze nụrụ okwu niile dị nʼime Akwụkwọ Iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya.
2KI 22:12 O nyere Hilkaya bụ onyeisi nchụaja, Ahikam nwa Shefan, Akboa nwa Mikaya, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha,
2KI 22:13 “Gaanụ jụta Onyenwe anyị ase, nʼisi m na nʼisi ndị m, na Juda niile, banyere ihe niile e dere nʼakwụkwọ a nke a chọtara. Nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị dị ukwuu bụ nke na-ere ọkụ megide anyị, nʼihi na ndị bu anyị ụzọ erubeghị isi nʼokwu nke akwụkwọ iwu a, ha agbasoghị ihe niile e dere nʼime ya banyere anyị.”
2KI 22:14 Hilkaya onye nchụaja, Ahikam, Akboa, Shefan na Asaya, jekwuuru Hulda, bụ onye amụma nwanyị. Onye bụ nwunye Shalum, nwa Tikva, nwa Hahas, ọ bụ onye na-elekọta uwe. Hulda na-ebi na mpaghara Jerusalem e wuru ọhụrụ.
2KI 22:15 Ọ sịrị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel kwuru: Gwanụ nwoke ahụ ziri unu ka unu bịakwutem, sị,
2KI 22:16 ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga iweta mbibi ga-adakwasị ebe a na ndị niile bi nʼime ya, dịka ihe niile e dere nʼime akwụkwọ nke eze Juda gụrụ, si dị.
2KI 22:17 Nʼihi na ha ajụla m, gbakụta m azụ, chụọ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, kpasuo m iwe site na arụsị niile nke aka ha mepụtara. Iwe m ga-adị ọkụ megide ebe a, ọ gaghị akwụsịkwa.’
2KI 22:18 Gwanụ eze Juda, onye ahụ zitere unu ịjụta ase site nʼọnụ Onyenwe anyị sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu banyere okwu ndị ahụ ị nụrụ.
2KI 22:19 Nʼihi na o wutere gị nʼobi, na i wedakwara onwe gị nʼala nʼihu Chineke, mgbe ị nụrụ ihe m kwuru megide ebe a na ndị bi nʼime ya, na ha ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ, na ihe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi na i dọwara uwe gị, bekwaa akwa nʼihu m, mụ onwe m anụkwala, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
2KI 22:20 Ya mere, aga m achịkọta gị nye nna nna gị ha, a ga-eli gị nʼudo. Anya gị agaghị ahụ mbibi nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ebe a.’ ” Ha laghachiri inye eze ọsịsa ya.
2KI 23:1 Mgbe ahụ, eze zigara ozi kpọkọta ndị okenye Juda na Jerusalem.
2KI 23:2 Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị amụma niile, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.
2KI 23:3 Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu Onyenwe anyị, ịgbaso Onyenwe anyị, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile, debe ihe niile o nyere nʼiwu, nʼihe ama ya niile na ụkpụrụ ya niile. O si otu a mee ka okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ guzosie ike. Mgbe ahụ, ndị mmadụ niile kwekwara nkwa idebe ọgbụgba ndụ ahụ.
2KI 23:4 Eze nyere Hilkaya onyeisi nchụaja na ndị nchụaja na-esote nʼọkwa, na ndị na-eche ọnụ ụzọ mbata, iwu ka ha site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị kwapụtasịa ngwongwo niile e mere nye Baal, na Ashera, na usuu ihe niile nke mbara eluigwe. O sunyere ha niile ọkụ nʼazụ Jerusalem, nʼọhịa dị na Ndagwurugwu Kidrọn, buru ntụ ha bulaa Betel.
2KI 23:5 Ọ chụdara ndị nchụaja arụsị ndị ahụ niile, bụ ndị eze Juda họpụtara isure ihe na-esi isi ụtọ nʼelu ebe dị elu nke obodo Juda nakwa ebe dị ọkụ. Nʼihi na ndị nchụaja ndị a achụọla aja, surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu niile dị nʼobodo dị iche iche na Juda, nakwa ndị dị gburugburu Jerusalem. Ha bụ ndị surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, na anyanwụ, ọnwa na kpakpando, nyekwa usuu niile nke mbara eluigwe.
2KI 23:6 O sikwa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ ogidi chi Ashera, wezuga ya nʼazụ Jerusalem, na Ndagwurugwu Kidrọn. Ebe ahụ ka ọ nọ suo ya ọkụ, supịa ya ka ọ ghọọ ntụ, fesaa ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu.
2KI 23:7 Ọ kwadakwara ụlọ obibi ụmụ ndị ikom na-agba akwụna dị nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼebe ndị inyom na-anọ na-akpara Ashera akwa.
2KI 23:8 O mere ka ndị nchụaja niile site nʼobodo Juda niile bịa, o merụkwara ebe ịchụ aja niile nke dị elu, site na Geba ruo Bịasheba, ebe ndị nchụaja ndị a nọrọ suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ọ kwatụrụ ọnụ ụzọ ama nke dị nʼebe ọnụ ụzọ ama Joshua, onye bụ gọvanọ obodo, nke dị nʼakụkụ aka ekpe nke ọnụ ụzọ ama obodo.
2KI 23:9 Ma e kweghị ka ndị nchụaja ahụ jee ozi nʼụlọnsọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ma o nyere ha ike iso ndị nchụaja ndị ọzọ rie achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
2KI 23:10 Josaya merụrụ Tofet, laa ya nʼiyi. Tofet bụ ebe ịchụ aja dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. O mere nke a igbochi mmadụ ọbụla iji nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị chụọrọ chi Molek aja nsure ọkụ.
2KI 23:11 O sitere nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị wepụ ịnyịnya ndị ahụ ndị eze Juda doro nsọ nye anyanwụ. Ịnyịnya ndị a dị nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị nʼebe dị nso nʼụlọ onyeozi aha ya bụ Netan-Melek. Josaya kpọrọ ụgbọ agha ndị a niile e doro nsọ nye anyanwụ ọkụ.
2KI 23:12 Josaya kwadara ebe ịchụ aja niile nke ndị eze Juda wukwasịrị nʼelu ụlọeze, nʼelu elu ụlọ Ehaz. Ọ kwadakwara ebe ịchụ aja niile nke Manase wuru nʼime ogige abụọ nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kporo ha kpofuo nʼime Ndagwurugwu Kidrọn.
2KI 23:13 Eze merụkwara ebe ịchụ aja niile dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo Jerusalem nʼakụkụ ndịda nke Ugwu Mbibi, nke Solomọn eze Izrel wuru nye chi Ashtọret, ihe arụ ndị Saịdọn, na chi Kemosh, ihe arụ ndị Moab, na chi Molek, ihe arụ ụmụ Amọn.
2KI 23:14 Josaya kwadakwara ogidi nkume niile, gbutuo ihe arụsị Ashera niile, werekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ wụsa nʼelu ala ahụ niile.
2KI 23:15 Josaya kwadakwara ogidi niile dị na Betel, nke Jeroboam nwa Nebat wuru mgbe o dubara ndị Izrel na mmehie. Ọ kwadara ebe ịchụ aja dị nʼebe ahụ, kụjisie nkume e doro nʼebe ahụ, gwerie ha dịka ntụ. Ọ kpọkwara arụsị Ashera ọkụ.
2KI 23:16 Josaya legharịkwara anya gburugburu hụ ọtụtụ ili dị nʼelu ugwu. O ziri ndị ohu ya ka ha gaa chịpụtasịa ọkpụkpụ dị nʼili ahụ niile, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja imerụ ya, dịka okwu Onyenwe anyị si dị, nke onye nke Chineke kwupụtara mgbe o buru amụma banyere ihe ndị a.
2KI 23:17 Josaya jụrụ ndị guzo nʼebe ahụ ajụjụ sị, “Ọ bụ ili onye bụ nke a?” Ndị ikom obodo ahụ zara sị, “Ọ bụ ili onye nke Chineke ahụ si Juda bịa buo amụma megide ebe ịchụ aja Betel. O buru amụma na ihe ndị a ị na-eme ebe ịchụ aja a ga-emezu.”
2KI 23:18 Mgbe ahụ, Josaya zara sị ha, “Hapụnụ ya ka o guzoro onwe ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịchịpụta ọkpụkpụ ya.” Ha hapụrụ ọkpụkpụ ya, hapụkwa ọkpụkpụ onye amụma ahụ si Sameria bịa.
2KI 23:19 Dịka o mere na Betel, otu a ka Josaya wepụrụ ma merụkwaa ebe ịchụ aja niile dị nʼebe niile dị elu nke ndị eze Izrel wuru nʼobodo niile nke Sameria, bụ ebe ịchụ aja kpasuru Onyenwe anyị iwe.
2KI 23:20 O gburu ndị nchụaja chi ndị a niile nʼelu ebe ịchụ aja ha, suo ọkpụkpụ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ha. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, ọ laghachiri na Jerusalem.
2KI 23:21 Eze nyere ndị Juda niile iwu sị ha, “Meerenụ Onyenwe anyị Chineke unu Mmemme Ngabiga, dịka e dere ya nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ a.”
2KI 23:22 O nwebeghị mgbe e mere ụdị Mmemme Ngabiga dịka nke a nʼoge ọbụla, site nʼụbọchị ndị ikpe bụ ndị duru Izrel maọbụ nʼụbọchị ndị eze Izrel na eze niile chịrị Juda, ọ dịghị nke yiri Mmemme Ngabiga a.
2KI 23:23 Ma ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị eze Josaya, nʼime Jerusalem ka a nọ mee Mmemme Ngabiga a nye Onyenwe anyị.
2KI 23:24 Ọzọkwa, Josaya gara nʼihu kpochapụ ndị niile na-ajụta mmụọ ọjọọ ase, na ndị dibịa afa, na arụsị ezinaụlọ dị iche iche, na arụsị a pịrị apị, na ihe arụ niile nke a hụrụ nʼime Juda na Jerusalem niile. O mere nke a ka e mezuo ihe niile e dere nʼime akwụkwọ ahụ Hilkaya onye nchụaja chọtara nʼụlọ Onyenwe anyị.
2KI 23:25 Ọ dịghị eze ọzọ nʼime ndị niile buru ya ụzọ chịa nke dịka Josaya, onye chigharịkwutere Onyenwe anyị. Onye ji obi ya niile, na mmụọ ya niile na ike ya niile debe iwu niile e nyere Mosis. Ọ dịkwaghị eze ọzọ dịka ya, onye biliri mgbe ọ nwụsịrị.
2KI 23:26 Ma ihe ndị a emeghị ka iwe ọkụ Onyenwe anyị na-ewe megide Juda dajụọ, bụ iwe a kpasuru ya nʼihi ihe ọjọọ niile nke Manase mere.
2KI 23:27 Ya mere, Onyenwe anyị sịrị, “Aga m ekpochapụ Juda niile site nʼihu m, dịka m si kpochapụ Izrel niile. Aga m ajụkwa obodo ahụ m họpụtara, bụ Jerusalem, jụkwa ụlọnsọ ukwu a nke m kwuru banyere ya sị, ‘Nʼime ya ka Aha m ga-adị.’ ”
2KI 23:28 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Josaya na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
2KI 23:29 Nʼoge Josaya bụ eze, Fero Neko, eze Ijipt, gbagoro gaa nʼakụkụ osimiri Yufretis inyere eze Asịrịa aka. Eze Josaya pụkwara izute ya nʼagha, ma Neko zutere ya nʼagha, gbuo ya na Megido.
2KI 23:30 Ndị na-ejere Josaya ozi sị na Megido buru ozu ya nʼime ụgbọ agha bulata ya na Jerusalem, lie ya nʼili nke aka ya. Ndị ala ahụ kpọọrọ Jehoahaz nwa nwoke Josaya, tee ya mmanụ, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya.
2KI 23:31 Jehoahaz gbara iri afọ abụọ na atọ mgbe o bidoro ịchị, ma ọ chịrị na Jerusalem ọnwa atọ. Aha nne ya bụ Hamutal, nwa Jeremaya onye Libna.
2KI 23:32 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ndị eze buru ya ụzọ.
2KI 23:33 Ma Fero Neko keere ya agbụ na Ribla nʼala Hamat, ime ka ọ ghara ịchịkwa na Jerusalem. Neko kwagidere ndị Juda ka ha tụọrọ ya ụtụ narị talenti ọlaọcha, na otu talenti ọlaedo.
2KI 23:34 Fero Neko mere Eliakịm nwa nwoke Josaya, eze, nʼọnọdụ Josaya bụ nna ya. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma o duuru Jehoahaz gaa Ijipt, ebe ọ nọ nwụọ.
2KI 23:35 Jehoiakim kwụrụ Fero Neko ọlaọcha na ọlaedo ahụ ọ nara nʼaka ya. Ka o nwee ike mee nke a, o kere ụtụ nʼala ahụ, werekwa ike nara ndị ala ahụ ọlaọcha na ọlaedo, dịka mkpebi ha si dị banyere ihe onye ahụ ga-akwụ.
2KI 23:36 Jehoiakim gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zebida nwa Pedaya, onye Ruma.
2KI 23:37 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, dịka ihe niile nna ya ha ndị bu ya ụzọ mere.
2KI 24:1 Nʼoge Jehoiakim na-achị, Nebukadneza eze Babilọn ji ike bata nʼala ya, mee ka Jehoiakim ghọọ ohu ya afọ atọ. Ma o mesịrị tụgharịa megide Nebukadneza, nupukwa isi nʼokpuru ya.
2KI 24:2 Onyenwe anyị zigara ndị na-apụnara mmadụ ihe site na Kaldịa, Aram, Moab na ndị Amọn, ka ha ga bibie Juda. Ọ bụ nʼusoro okwu Onyenwe anyị kpọsara site nʼọnụ ndị amụma ya.
2KI 24:3 Nʼezie, ihe ndị a bịakwasịrị Juda dịka Onyenwe anyị si nye ya nʼiwu, ka o si otu a kpochapụ ha site nʼihu ya nʼihi mmehie niile Manase mere, na dịka ihe niile o mere si dị,
2KI 24:4 tinyere ọbara ndị aka ha dị ọcha nke ọ wusiri. Nʼihi na o mere ka ọbara ndị aka ha dị ọcha jupụta na Jerusalem. Onyenwe anyị ekwekwaghị agbaghara ajọ omume dị otu a.
2KI 24:5 Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼụbọchị ndụ ndị eze Juda?
2KI 24:6 Jehoiakim sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze ọhụrụ nʼọnọdụ ya.
2KI 24:7 Ma eze Ijipt esiteghị nʼala ya pụta ọzọ, nʼihi na eze Babilọn nọchiri oke ala ya niile, site na mmiri iyi Ijipt ruo nʼoke Osimiri Yufretis.
2KI 24:8 Jehoiakin gbara afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị naanị ọnwa atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Nehushta, nwa Elnatan, onye Jerusalem.
2KI 24:9 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna ya ha mere.
2KI 24:10 Nʼoge ọ bụ eze, ndịisi Nebukadneza, eze Babilọn bịara, gbaa Jerusalem gburugburu ma nọchibido obodo ahụ nʼagha.
2KI 24:11 Nebukadneza, eze Babilọn nʼonwe ya, bịara nʼobodo ahụ mgbe ndị agha ya gbara ya gburugburu.
2KI 24:12 Jehoiakin, bụ eze Juda, na nne ya na ndị ọrụ ya niile na ndịisi niile na ndịisi ozi ya niile were onwe ha nyefee Nebukadneza nʼaka. Nʼafọ asatọ nke ọchịchị eze Babilọn ka ọ kpụụrụ Jehoiakin dịka onye mkpọrọ.
2KI 24:13 Ọ kwakọọrọ akụ niile dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ndị nke dị nʼụlọeze, o gbukakwara ihe ọlaedo niile Solomọn eze Izrel tinyere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị buru ha bulaa Babilọn, ihe a niile mere dịka Onyenwe anyị kwururịị.
2KI 24:14 O bupụkwara puku ndị ikom iri site na Jerusalem bulaa ha Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha. Ndị so nʼime ndị a bụ ndịisi niile na ndị agha niile. O bupụkwara ndị na-akwa ǹka niile na ndị ọkpụ ụzụ. Naanị ndị na-enweghị ike, na ndị ogbenye ka ọ hapụrụ nʼala ahụ.
2KI 24:15 Nebukadneza kpụụrụ Jehoiakin ka ọ ga biri na Babilọn. O sikwa na Jerusalem kpọrọ nne eze, na ndị nwunye eze, ndị ozi ya, na ndị niile a ma ama nʼala ahụ gaa Babilọn.
2KI 24:16 Eze Babilọn bupụkwara ndị ikom niile dị ike ma tozukwaa ibu agha, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku asaa, tinyere otu puku ndị ọrụ aka, na ndị ọrụ ǹka, bulaa ha Babilọn.
2KI 24:17 O mere nwanne nna Jehoiakin, bụ Matanaya, eze nʼọnọdụ ya. Ọ gụgharịrị ya aha, kpọọ ya Zedekaya.
2KI 24:18 Iri afọ abụọ na otu ka Zedekaya gbara mgbe ọ malitere ịbụ eze nʼime Jerusalem. Aha nne ya bụ Hamutal, nwa Jeremaya onye Libna. Ọ chịrị dịka eze na Jerusalem afọ iri na otu.
2KI 24:19 Ma o mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jehoiakim mere.
2KI 24:20 Ọ bụ nʼihi iwe Onyenwe anyị ka ihe ndị a niile ji bịakwasị Jerusalem na Juda. Nʼikpeazụ, o sitere nʼihu ya chụpụ ha. Nʼoge a, Zedekaya nupuru isi nʼokpuru eze Babilọn.
2KI 25:1 Nʼafọ nke itoolu nke ọchịchị ya, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, Nebukadneza, eze Babilọn duuru ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha. Ọ mara ụlọ ikwu nʼazụ obodo ahụ, wukwaa mgbidi nnọchibido gburugburu obodo ahụ.
2KI 25:2 Anọchibidoro obodo a nʼagha ruo nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Zedekaya.
2KI 25:3 Nʼụbọchị nke itoolu nke ọnwa anọ nʼafọ ahụ, oke ụnwụ siri ike dị nʼobodo ahụ ruo na ọ dịkwaghị nri dị nke ndị mmadụ ga-eri.
2KI 25:4 Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Kaldịa nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba.
2KI 25:5 Ma ndị agha Kaldịa chụsoro eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya,
2KI 25:6 e jide ya. Ha kpụgara ya eze Babilọn, nʼobodo Ribla, ebe a nọ maa ya ikpe.
2KI 25:7 Ha gburu ụmụ ndị ikom Zedekaya nʼihu ya. Ha ghụpụrụ anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya gaa Babilọn.
2KI 25:8 Nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke ise nke afọ iri na itoolu nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche, onyeisi nʼọrụ eze Babilọn, bịarutere Jerusalem.
2KI 25:9 O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ
2KI 25:10 Ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze kwaturu mgbidi niile gbara Jerusalem gburugburu.
2KI 25:11 Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buuru ụfọdụ mmadụ ndị fọdụrụ nʼobodo, na ndị niile fọdụkwara, ha na ndị ọzọ ahụ ji aka ha gbakwuru eze bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ.
2KI 25:12 Ma ọchịagha ahụ, hapụrụ ụfọdụ na ndị ahụ bụ nnọọ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ka ha na-elekọta ubi vaịnị niile a gbara ogige na ala ubi niile.
2KI 25:13 Ma ndị Babilọn tipịara ogidi bronz niile, ha na ihe ndọkwasị niile na oke osimiri bronz ndị ahụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, buru bronz ndị ahụ bulaa Babilọn.
2KI 25:14 Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile, na ihe ịkpakepụ ọkụ, na ngaji ukwu niile na ngwa bronz niile nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ.
2KI 25:15 Ọchịagha ndị nche eze, chịrị ihe ịgụnye ọkụ niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ya bụ ihe ndị ahụ niile e ji ọlaedo a nụchara anụcha maọbụ ọlaọcha kpụọ.
2KI 25:16 O bukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha karịrị ihe a ga-eji ihe ọtụtụ tụọ.
2KI 25:17 Ị dị elu nke otu nʼime ogidi abụọ ndị a bụ mita asatọ na ụma nʼọtụtụ. Isi bronz nke e kpukwasịrị nʼotu ogidi dị otu mita na ọkara nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya.
2KI 25:18 Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata.
2KI 25:19 O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom ise na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii ndị ọrụ mmanye, ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ.
2KI 25:20 Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla.
2KI 25:21 Nʼebe ahụ, na Ribla dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile. Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ.
2KI 25:22 Emesịa, Nebukadneza eze Babilọn họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa nwa Shefan, ka ọ bụrụ onye na-elekọta ndị fọdụrụ na Juda,
2KI 25:23 Mgbe ndịisi agha na ndị ikom ha nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya onye na-achị ala ahụ, ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ, Ishmel nwa Netanaya, Johanan nwa Kariya, Seraya nwa Tanhumet, onye Netofa, na Jaazanaya nwa onye Maaka, na ndị ikom ha.
2KI 25:24 Gedaliya ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha, sị, “Unu atụla egwu nʼihi ndịisi ọrụ Babilọn. Birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma.”
2KI 25:25 Ma nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye ya onwe ya si nʼagbụrụ eze, duuru mmadụ iri bịa Mizpa, tigbuo Gedaliya, na ndị ikom Juda na ndị Kaldịa niile, bụ ndị ya na ha nọ.
2KI 25:26 Nke a mere ka ndị Juda niile, site nʼonye nta ruo nʼonye ukwu, ha na ndịisi agha ndị ahụ biliri gaa Ijipt, nʼihi na ha tụrụ ndị Kaldịa egwu.
2KI 25:27 Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn, o mere ka Jehoiakin si nʼụlọ mkpọrọ pụta nwere onwe ya. Ọ bụ nʼụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa iri na abụọ ka o mere nke a.
2KI 25:28 Ọ gwara ya okwu ọma, nye ya oche ọnọdụ ya dị elu karịa nke ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babilọn.
2KI 25:29 Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri.
2KI 25:30 Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ.
1CH 1:1 Adam, Set, Enọsh,
1CH 1:2 Kenan, Mahalalel, Jared,
1CH 1:3 Enọk, Metusela, Lamek, na Noa.
1CH 1:4 Ụmụ Noa bụ Shem, Ham, na Jafet.
1CH 1:5 Ụmụ ndị ikom Jafet bụ: Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras.
1CH 1:6 Ụmụ ndị ikom Goma bụ Ashkenaz, na Rifat, na Togama.
1CH 1:7 Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim, na Rodanim.
1CH 1:8 Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan.
1CH 1:9 Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama, na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan.
1CH 1:10 Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa.
1CH 1:11 Ijipt bụ nna ndị Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh,
1CH 1:12 ndị Patrus, na ndị Kasluh (onye ndị Filistia sitere na ya) na ndị Kafto.
1CH 1:13 Kenan bụ nna Saịdọn, ọkpara ya, na ndị Het,
1CH 1:14 ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash,
1CH 1:15 ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini,
1CH 1:16 ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat.
1CH 1:17 Ụmụ ndị ikom Shem bụ Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram. Ụmụ Aram bụ Uz, Hul, Geta na Meshek.
1CH 1:18 Apakshad bụ nna Shela; Shela bụrụ nna Eba.
1CH 1:19 Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Aha otu nʼime ha bụ Peleg, nʼihi na ọ bụ nʼoge ndụ ya ka e kewara ụwa; aha nwanne ya nwoke bụ Joktan.
1CH 1:20 Joktan bụ nna Almodad, Shelef, Hazamavet, Jera,
1CH 1:21 Hadoram, Ụzal, Dikla,
1CH 1:22 Obal, Abimael, Sheba,
1CH 1:23 Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan.
1CH 1:24 Shem, Apakshad, Shela,
1CH 1:25 Eba, Peleg, Reu,
1CH 1:26 Serug, Nahọ, Tera
1CH 1:27 na Ebram, ya bụ Ebraham.
1CH 1:28 Ụmụ Ebraham mụrụ bụ Aịzik na Ishmel.
1CH 1:29 Ndị a bụ ụmụ ụmụ ha: Nebaiot (ọkpara Ishmel), Keda, Adbel, Mibsam,
1CH 1:30 Mishma, Duma, Masa, Hadad, Tema,
1CH 1:31 Jetua, Nafish na Kedema. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ishmel.
1CH 1:32 Ketura, iko nwanyị Ebraham, mụtaara ya Zimran, Jokshan, Medan, Midian, Ishbak na Shua. Jokshan mụtara ndị a: Sheba na Dedan.
1CH 1:33 Ụmụ ndị ikom Midian bụ: Efaa, Efe, Hanok, Abida na Eldaa. Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Ketura.
1CH 1:34 Ebraham mụtara Aịzik. Ụmụ ndị ikom Aịzik bụ Ịsọ na Izrel.
1CH 1:35 Ịsọ mụrụ ndị a: Elifaz, Reuel, Jeush, Jalam na Kora.
1CH 1:36 Ụmụ Elifaz bụ Teman, Ọmaa, Zefi, Gatam na Kenaz, na Amalek, site na Timna.
1CH 1:37 Ụmụ ndị ikom Reuel bụ: Nahat, Zera, Shama, na Miza.
1CH 1:38 Ụmụ ndị ikom Sia bụ Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana, Dishọn, Eza na Dishan.
1CH 1:39 Ụmụ ndị ikom Lotan bụ Hori na Homam. Timna bụkwa nwanne nwanyị Lotan.
1CH 1:40 Ụmụ ndị ikom Shobal bụ Alvan, Manahat, Ebal, Shefo na Onam. Zibiọn mụrụ Aịa na Ana.
1CH 1:41 Ana mụrụ Dishọn. Ụmụ Dishọn bụ Hamran, na Eshban, na Itran, na Keran.
1CH 1:42 Ụmụ ndị ikom Eza bụ Bilhan, na Zaavan, na Akan. Ụmụ ndị ikom Dishan bụ Uz na Aran.
1CH 1:43 Ndị a bụ ndị eze chịrị nʼEdọm tupu ndị Izrel enwee eze nke ha. Bela nwa Beoa, onye aha obodo ya bụ Dinhaba.
1CH 1:44 Mgbe Bela nwụrụ Jobab nwa Zera, onye Bozra nọchiri ya dịka eze.
1CH 1:45 Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye si nʼala Teman nọchiri ya dịka eze.
1CH 1:46 Mgbe Husham nwụrụ, Hadad nwa Bedad, onye meriri ndị agha Midia nʼọzara Moab, ghọrọ eze. Isi obodo ya bụ Avit.
1CH 1:47 Mgbe Hadad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya dịka eze.
1CH 1:48 Mgbe Samla nwụrụ, Shaul onye sitere na Rehobọt dị nʼakụkụ osimiri nọchiri ya dịka eze.
1CH 1:49 Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-Hanan nwa Akboa, nọchiri ya dịka eze.
1CH 1:50 Mgbe Baal-Hanan nwụrụ, Hadad nọchiri ya dịka eze. Akpọrọ isi obodo ya Pai. Aha nwunye ya bụ Mehetabel, nwa Matred, nwa nwa Mezahab.
1CH 1:51 Hadad mesịrị nwụọkwa. Ndịisi ọnụmara nʼEdọm bụ Timna, Alva, Jetet,
1CH 1:52 Oholibama, Elaa, Pinon,
1CH 1:53 Kenaz, Teman, Mibza,
1CH 1:54 Magdiel na Iram. Ndị a bụ ndịisi ọnụmara nʼEdọm.
1CH 2:1 Izrel mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a: Ruben, Simiọn, Livayị, Juda, Isaka, na Zebụlọn,
1CH 2:2 Dan, Josef, Benjamin, Naftalị, Gad na Asha.
1CH 2:3 Juda mụtara ụmụ ndị ikom atọ site na nwunye ya Bat-shua, onye Kenan. Aha ha bụ Ịa, Onan na Shela. Ma Ịa ọkpara Juda bụ nnọọ mmadụ ọjọọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi ya, Onyenwe anyị gburu ya.
1CH 2:4 Juda mụtakwara ụmụ nwoke abụọ ọzọ, Perez na Zera, site na Tama nwunye nwa ya nwoke. Ụmụ ndị nwoke niile Juda dị ise.
1CH 2:5 Ụmụ ndị ikom Perez bụ, Hezrọn na Hamul.
1CH 2:6 Zera mụrụ: Zimri, na Etan, na Heman, na Kalkol, na Dara. Ha dị ndị ikom ise nʼọnụọgụgụ.
1CH 2:7 Ekan nwa Kami, bụ onye ahụ tinyere ndị Izrel na nsogbu, site nʼihe o mere nke gbasara ihe e doro nsọ.
1CH 2:8 Etan mụrụ Azaraya.
1CH 2:9 Hezrọn mụtara Jerameel, Ram na Kaleb.
1CH 2:10 Ram mụrụ Aminadab, Aminadab amụọ Nashọn onyendu a maara ama na Juda.
1CH 2:11 Nashọn mụrụ Salma, Salma amụọ Boaz.
1CH 2:12 Boaz amụta Obed, Obed amụọ Jesi.
1CH 2:13 Nwa nwoke mbụ Jesi mụrụ bụ Eliab; nke abụọ bụ Abinadab, nke atọ bụ Shimea.
1CH 2:14 Nke anọ bụ Netanel, nke ise bụ Radai,
1CH 2:15 nke isii Ozem, nke asaa Devid.
1CH 2:16 Ọ mụkwara ụmụ nwanyị abụọ site nʼaka nwunye ya, ndị aha ha bụ Zeruaya na Abigel. Zeruaya mụrụ Abishai, na Joab, na Asahel.
1CH 2:17 Abigel, nwunye Jeta onye Ishmel mụrụ Amasa.
1CH 2:18 Kaleb nwa Hezrọn lụrụ ụmụ nwanyị abụọ, Azuba na Jeriọt. Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a Jesha, Shobab na Adọn.
1CH 2:19 Mgbe Azuba nwụrụ, Kaleb lụrụ nwunye ọzọ. Aha ya bụ Efrat, onye mụtaara ya Hua.
1CH 2:20 Hua mụrụ Uri, Uri mụtara Bezalel.
1CH 2:21 Mgbe Hezrọn gbara iri afọ isii, ọ lụrụ ada Makia onye mụtaara ya Segub. Makia bụ nna Gilead.
1CH 2:22 Segub mụrụ Jaịa, onye chịrị iri obodo abụọ na atọ na Gilead.
1CH 2:23 Ma Geshua na Aram dọtara obodo Jaịa nʼagha, dọtakwa Kenat nʼagha, ya na iri obodo nta isii ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ndị a niile bụ ụmụ Makia nna Gilead.
1CH 2:24 Mgbe Hezrọn nwụrụ nʼobodo Kaleb Efrata, Abija nwunye Hezrọn mụtaara ya Ashua, onye bụ nna Tekoa.
1CH 2:25 Jerameel ọkpara Hezrọn mụtara Ram, onye bụ ọkpara ya, mụọkwa Buna, na Oren, na Ozem, na Ahija.
1CH 2:26 Nwunye Jerameel nke abụọ, aha ya bụ Atara, mụtara Onam.
1CH 2:27 Ram ọkpara Jerameel mụtara ụmụ ndị ikom ndị a: Maaz, na Jamin, na Eka.
1CH 2:28 Ụmụ Onam mụrụ bụ Shamai, na Jada. Shamai mụkwara Nadab, na Abishua.
1CH 2:29 Abishua na nwunye ya Abihail mụrụ Aban, na Molid.
1CH 2:30 Ụmụ Nadab mụrụ bụ Seled, na Apaim. Seled nwụrụ na-amụtaghị nwa ọbụla.
1CH 2:31 Ma Apaim mụtara Ishi. Ishi mụrụ Sheshan, Sheshan amụtakwa Alai.
1CH 2:32 Jada nwanne Shamai mụtara ụmụ ndị ikom abụọ, Jeta na Jonatan. Jeta amụtaghị nwa ọbụla,
1CH 2:33 ma Jonatan mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Pelet na Zaza. Ndị a bụ ụmụ Jerameel.
1CH 2:34 Sheshan mụtara ọtụtụ ụmụ nwanyị, ma o nweghị nwa nwoke. O nwere otu ohu bụ onye Ijipt, aha ya bụ Jaha.
1CH 2:35 O weere ada ya nwanyị nye odibo ya bụ Jaha, ka ọ bụrụ nwunye ya. Ọ mụtara ya otu nwa nwoke aha ya bụ Atai.
1CH 2:36 Atai mụrụ Netan, Netan mụrụ Zabad,
1CH 2:37 Zabad amụọ Eflal. Nwa Eflal bụ Obed,
1CH 2:38 ma Obed mụrụ Jehu. Jehu amụọ Azaraya.
1CH 2:39 Azaraya bụ nna Helez, Helez mụrụ Eleasa.
1CH 2:40 Eleasa mụrụ Sismai, Sismai amụọ Shalum.
1CH 2:41 Shalum bụ nna Jekamaya, ebe Jekamaya mụrụ Elishama.
1CH 2:42 Ụmụ ndị ikom Kaleb nwanne Jerameel bụ Mesha onye bụ ọkpara ya, nna Zif, onye mụrụ Maresha nna Hebrọn.
1CH 2:43 Hebrọn mụrụ ndị a: Kora, Tapụọa, Rekem na Shema.
1CH 2:44 Shema mụrụ Raham, onye bụ nna Jokean. Rekem mụrụ Shamai.
1CH 2:45 Ọkpara Shamai bụ Maon, onye mụrụ Bet Zoa.
1CH 2:46 Efaa, iko nwanyị Kaleb, mụtaara ya Haran, Moza na Gazez. Haran mụtakwara nwa ọ kpọrọ aha ya Gazez.
1CH 2:47 Jadia mụtara ndị ikom ndị a: Regem, Jotam, Gesham, Pelet, Efaa na Shaaf.
1CH 2:48 Maaka, iko nwanyị ọzọ Kaleb nwere mụtaara ya ndị a: Sheba na Tiahana,
1CH 2:49 ọ mụtakwara Shaaf, onye bụ nna Madmanna, Sheva nna Makbena, tinyere Gibea. Aha nwa nwanyị Kaleb mụtara bụ Aksa.
1CH 2:50 Ndị a bụ ụmụ Kaleb. Ụmụ Hua, ọkpara Efrata mụrụ bụ, Shobal, nna Kiriat Jearim,
1CH 2:51 Salma nna Betlehem, na Haref, nna Bet-Gadea.
1CH 2:52 Ụmụ Shobal nna Kiriat Jearim mụrụ bụ Haroe, onye mụrụ ọkara ndị ikwu Menuhot.
1CH 2:53 Ya mụtakwara ndị ikwu Kiriat Jearim, ndị Itra, ndị Put, ndị Shumat na ndị Mishra. Nʼime ndị a ka ndị Zorat na ndị Eshtaol si pụta.
1CH 2:54 Salma mụtara ikwu ndị a: Betlehem, ndị Netofa, ndị Atrot Bet Joab, ụfọdụ ndị Manaha na ndị Zoa.
1CH 2:55 Ụfọdụ ha bụ ikwu ndị ode akwụkwọ, ndị bi nʼobodo Jabez: ndị Tirait, na ndị Shimea, na ndị Suka. Ndị a niile bụ ndị Ken, ndị sitere nʼagbụrụ Hamat, nna ndị ikwu Rekab.
1CH 3:1 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Devid, ndị amụụrụ ya mgbe ọ nọ na Hebrọn. Ọkpara ya bụ Amnọn, nke Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ. Nwa ya nke abụọ bụ Daniel, onye nne ya bụ Abigel onye Kamel.
1CH 3:2 Nke atọ bụ Absalọm, nwa Maaka, nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua. Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit
1CH 3:3 Nke ise bụ Shefataya, nwa Abital. Nke isii bụ Itream, nke nwunye ya bụ Egla mụrụ.
1CH 3:4 Ụmụ ndị ikom isii ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn, ebe ọ nọ chịa dịka eze afọ asaa na ọnwa isii. Devid chịrị na Jerusalem iri afọ atọ na atọ.
1CH 3:5 Ndị a bụkwa ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ: Shamua, Shobab, Netan na Solomọn. Mmadụ anọ ndị a bụ ndị Batsheba nwa nwanyị Amiel mụrụ.
1CH 3:6 Ndị ọzọ bụkwa Ibha, Elishua, Elifelet,
1CH 3:7 Noga, Nefeg, Jafia,
1CH 3:8 Elishama, Eliada na Elifelet. Ha niile dị itoolu nʼọnụọgụgụ.
1CH 3:9 Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Devid, na-agụnyeghị ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara. Tama bụ nwanne ha nwanyị.
1CH 3:10 Ndị a bụ ụmụ Solomọn: Rehoboam, na Abija, na Asa, na Jehoshafat,
1CH 3:11 na Joram, na Ahazaya, na Joash,
1CH 3:12 na Amazaya, na Azaraya, na Jotam,
1CH 3:13 na Ehaz, na Hezekaya, na Manase,
1CH 3:14 na Amọn, na Josaya.
1CH 3:15 Ụmụ ndị ikom Josaya: Johanan nwa mbụ ya, na Jehoiakim nwa ya nke abụọ, na Zedekaya nwa ya nke atọ, na Shalum nwa ya nke anọ.
1CH 3:16 Ụmụ Jehoiakim bụ ndị a, Jehoiakin nwa ya, na Zedekaya.
1CH 3:17 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Jehoiakin, eze ahụ a dọtara nʼagha: Shealtiel, nwa ya,
1CH 3:18 Malkiram, Pedaya, Shenaza, Jekamaya, Hoshama na Nedabaya.
1CH 3:19 Ụmụ ndị ikom Pedaya bụ Zerubabel na Shimei. Ụmụ ndị ikom Zerubabel bụ ndị a: Meshulam na Hananaya. Shelomit bụ nwanne ha nwanyị.
1CH 3:20 E nwekwara ndị ikom ise ọzọ aha ha bụ Hashuba, Ohel, Berekaya, Hasadaya na Jushab-Hesed.
1CH 3:21 Ụmụ Hananaya mụrụ bụ Pelataya na Jeshaya. Jeshaya mụrụ Refaya; Refaya mụrụ Anan na Ọbadaya, Ọbadaya mụrụ Shekanaya.
1CH 3:22 Ụmụ Shekanaya bụ ndị a: Shemaya na ụmụ ya ndị ikom: Hatush, Igal, Bariya, Nearaya na Shafat. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ.
1CH 3:23 Ụmụ Nearaya bụ ndị a, Elioenai, Hezekaya na Azrikam. Ha dị atọ nʼọnụọgụgụ.
1CH 3:24 Ndị Elioenai mụrụ bụ ndị a: Hodavaya, Eliashib, Pelaya, Akub, Johanan, Delaya na Ananị. Ha niile dị asaa nʼọnụọgụgụ.
1CH 4:1 Ndị ikwu Juda bụ Perez, Hezrọn, Kami, Hua na Shobal.
1CH 4:2 Shobal mụrụ Reaya, onye bụ nna Jahat. Jahat bụ nna Ahumai na Lahad, ndị a bụ ndị ikwu Zorat.
1CH 4:3 Ndị a bụ ụmụ Etam: Jezril, na Ishma, na Idbash, aha nwanne ha nwanyị bụ Hazelelponi.
1CH 4:4 Penuel bụ nna Gedoa, Eza bụ nna Husha. Ndị a bụ ụmụ Hua, bụ ọkpara Efrata, nna Betlehem.
1CH 4:5 Ashua nna Tekoa lụrụ ndị nwunye abụọ: Hela na Naara.
1CH 4:6 Naara mụtaara ya Ahuzam, na Hefa, na Temeni, na Haahashitari. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Naara.
1CH 4:7 Ụmụ ndị ikom Hela mụtara bụ Zeret, Zoha, Etnan
1CH 4:8 na Koz, onye bụ nna Anub na Hazobeba, nakwa nke ikwu Ahahel, nwa Harum.
1CH 4:9 Jabez bụ nwoke a na-asọpụrụ karịa ụmụnne ya ndị ikom niile. Nne ya kpọrọ aha ya Jabez, sị, “A mụrụ m ya nʼihe mgbu.”
1CH 4:10 Jabez tikuru Chineke Izrel mkpu akwa sị ya, “Biko gọzie m, mee ka oke ala m saa mbara. Kwere ka aka gị dịkwasị m, ma wezuga m site nʼihe mmerụ ahụ ọbụla, ka m si otu a gbanarị ihe mgbu.” Chineke zara ekpere ya meere ya ihe ọ rịọrọ.
1CH 4:11 Kelub, nwanne nwoke Shua mụrụ Mehia, nna Eshton,
1CH 4:12 Eshton mụrụ Bet-Raafa, na Pasea, na Tihina. Tihina mụrụ Ir Nahash. Ndị a niile bụ ndị ikwu Reka.
1CH 4:13 Ụmụ ndị ikom Kenaz mụtara bụ, Otniel na Seraya. Otniel amụta Hatat na Meonotai.
1CH 4:14 Meonotai bụ nna Ofra. Seraya bụ nna Joab, Joab bụ nna Ge Harashim. A kpọrọ ha Ge Harashim nʼihi na ha bụ ndị ǹka.
1CH 4:15 Kaleb nwa Jefune mụrụ Iru, Elaa na Naam. Ma Elaa mụrụ Kenaz.
1CH 4:16 Ụmụ ndị ikom Jehalelel mụrụ bụ ndị a: Zif, Zifa, Tiria na Asarel.
1CH 4:17 Ụmụ Ezra bụ Jeta, Mered, Efaa na Jalon. Otu nʼime ndị nwunye Mered lụrụ mụtara Miriam, Shamai na Ishba, bụ nna Eshtemoa.
1CH 4:18 Ndị a bụkwa ụmụ ndị ikom Bitaya, bụ nwa nwanyị Fero, nke Mered lụrụ. Nwunye ya nke si nʼebo Juda mụrụ Jered bụ nna Gedoa, Heba nna Soko na Jekutiel nna Zanoa.
1CH 4:19 Ụmụ ndị ikom nwunye Hodia, nwanne nwanyị Naham, bụ nna Keila onye Gam na Eshtemoa onye Maaka.
1CH 4:20 Ụmụ ndị ikom Shimon mụrụ bụ Amnọn, Rina, Ben-Hanan na Tilon. Ishi mụrụ Zohet na Ben-Zohet.
1CH 4:21 Ụmụ Shela nwa Juda mụrụ bụ Ịa, nna Leka, Laada, nna Maresha, na ikwu ndị ọrụ ịkpa ezi akwa ọcha nọ na Bet Ashbea
1CH 4:22 na Jokim, ndị ikom Koziba, na Joash na Saraf, ndị chịrị na Moab na Jashubi Lehem. Aha ndị a sitere nʼakwụkwọ akụkọ mgbe ochie.
1CH 4:23 Ha bụ ndị ọkpụ ite, ndị biri na Netaim ya na Gedera. Ha biri nʼebe ahụ nʼihi ịrụrụ eze ọrụ.
1CH 4:24 Simiọn mụrụ Nemuel, Jamin, Jarib, Zera na Shaul.
1CH 4:25 Shaul mụrụ Shalum nna Mibsam. Mibsam bụkwa nna Mishma.
1CH 4:26 Ụmụ Mishma mụrụ bụ Hamuel nwa ya, Zakua nwa ya na Shimei nwa ya.
1CH 4:27 Shimei mụrụ ndị ikom iri na isii, na ndị inyom isii. Ụmụnne ya ndị ikom enweghị ọtụtụ ụmụ dịka ya onwe ya. Nʼihi ya, ndị ikwu ya adịghị ukwu nʼọnụọgụgụ dịka ndị ọzọ na Juda.
1CH 4:28 Ha biri na Bịasheba, Molada, Haza Shual,
1CH 4:29 Bilha, Ezem, Tolad,
1CH 4:30 Betuel, Homa, Ziklag,
1CH 4:31 Bet-Makabot, Haza-Susim, Bet-Biri na Shaaraim. Ọ bụ ha bi nʼobodo ndị a niile tutu ruo nʼoge ọchịchị Devid.
1CH 4:32 Obodo gbara ha gburugburu bụ Etam, Ain, Rimọn, Token na Ashan, obodo ise,
1CH 4:33 tinyere obodo nta niile gbara obodo ndị a gburugburu ruo na Baalat. Ndị a bụ ebe obibi ha. Ha nwekwara akwụkwọ usoro ọmụmụ.
1CH 4:34 Meshobab, Jamlek, Josha nwa Amazaya,
1CH 4:35 Juel, Jehu nwa Joshibaya, nwa Seraya, nwa Asiel,
1CH 4:36 nakwa Elioenai, Jaakoba, Jeshohaya, Asaya, Adiel, Jesimiel na Benaya,
1CH 4:37 na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaya, nwa Shimri, nwa Shemaya.
1CH 4:38 Ndị ikom ndị a e depụtara aha ha bụ ndị ndu ikwu ha. Ezinaụlọ ha mụbara nke ukwuu,
1CH 4:39 ha gakwara na mpụta Gedoa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ndagwurugwu ịchọrọ igwe anụ ụlọ ha ebe ịta nri.
1CH 4:40 Ha chọtara ebe ịta ahịhịa anụ ụlọ mara mma, nke sara mbara, nke dị jụụ, bụrụkwa ebe nsogbu na-adịghị. Ụfọdụ nʼime ụmụ Ham ebiela nʼebe ahụ na mbụ.
1CH 4:41 Ndị ikom ndị a e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ bịara nʼoge Hezekaya na-achị dịka eze Juda. Ha busoro ụmụ Ham agha nʼebe obibi ha, busokwa ndị Meunim bi nʼebe ahụ agha, bibie ha kpamkpam, dịka ọ dị ruo taa. Emesịa ha bichiri ebe ahụ nʼihi na ebe ịta ahịhịa nke igwe anụ ụlọ ha nʼebe ahụ.
1CH 4:42 Ọzọkwa, narị ndị ikom ise nʼime ndị a si nʼebo Simiọn, ndị ndu ha bụ Pelataya, Nearaya, Refaya na Uziel, ụmụ Ishi busoro obodo ugwu ugwu Sia agha.
1CH 4:43 Ha gburu ndị Amalek fọdụrụ ndụ nʼebe ahụ, bichie ala ahụ ruo taa.
1CH 5:1 Ọkpara Izrel bụ Ruben. Ma nʼihi na ọ merụrụ ihe ndina nna ya site na idinakwuru nwunye nna ya, a napụrụ ya ọnọdụ ọkpara ya were ya nye ụmụ nwanne ya Josef mụtara. Nʼihi ya, akwụkwọ akụkọ usoro ọmụmụ ụmụ Izrel akpọghị Ruben ọkpara.
1CH 5:2 Ọ bụ ezie na Juda dị ike karịa ụmụnna ya, bụrụkwa eziokwu na onyendu si na Juda pụta, maọbụ Josef ka e nyere oke ruuru ọkpara.
1CH 5:3 Ruben, ọkpara Izrel mụrụ ndị ikom ndị a: Hanok, na Palu, na Hezrọn, na Kami.
1CH 5:4 Juel mụrụ Shemaya, nna Gog, Gog mụrụ Shimei.
1CH 5:5 Shimei mụrụ Maịka, Maịka amụọ Reaya. Reaya amụọ Baal.
1CH 5:6 Baal mụrụ Beera, onye Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa dọtara nʼagha. Beera bụkwa onyendu ndị Ruben.
1CH 5:7 Ndị ụmụnna ha dịka agbụrụ niile ha si dị, bụ ndị e depụtara aha ha dịka usoro ọmụmụ ha si dị; Jeiel onyeisi, na Zekaraya,
1CH 5:8 na Bela nwa Azaz nwa Shema, nwa Juel. Ha nwere ebe obibi ha site nʼAroea ruo nʼugwu Nebo, rukwaa Baal-Meon.
1CH 5:9 Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, nwekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ. Ọ bụkwa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼọnụ ọzara ruo nʼosimiri Yufretis ka ha na-azụ ha, nʼihi na anụ ụlọ ha nwere bara ụba na Gilead.
1CH 5:10 Nʼoge Sọl bụ eze Izrel, ụmụ Ruben meriri ndị Haga nʼagha, bichie ala ha niile dị nʼọwụwa anyanwụ Gilead.
1CH 5:11 Ụmụ Gad bi nʼakụkụ ha site na Bashan ruo Saleka.
1CH 5:12 Juel bụ onyendu na Bashan, Shafam na-esote ya, ya na Janai na Shafat.
1CH 5:13 Ụmụnna ha, ndị bụ ndị ndu ikwu asaa a bụ, Maikel, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Eba.
1CH 5:14 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Abihail, nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikel, nwa Jehishai, nwa Jado, nwa Buz.
1CH 5:15 Ahi nwa Abdiel, nwa Guni bụ onyeisi nʼetiti ụmụnna ya.
1CH 5:16 Ndị Gad nwere ebe obibi na Gilead nʼime Bashan, na nʼobodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha bikwa nʼebe ahịhịa anụ ụlọ na-ata jupụtara na Sharọn ruo nʼebe oke ala ha kwụsịrị.
1CH 5:17 E denyere aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nʼoge Jotam bụ eze Juda, na nʼoge Jeroboam bụ eze Izrel.
1CH 5:18 Ndị Ruben na ndị Gad, na ọkara ebo Manase nwere iri puku mmadụ anọ na anọ na narị asaa na iri isii (44,760) ndị jikeere ije agha, ndị dị ike, ndị a zụrụ iji ọta na mma agha, na ụta ibu agha.
1CH 5:19 Ha busoro ndị Haga, na Jetua, na Nafish na ndị Nodab agha.
1CH 5:20 E nyeere ha aka ibuso ha agha, Chineke nyefere ndị Haga na ndị niile na-enyere ha aka nʼaka ha, nʼihi na ha kpọkuru ya nʼoge ọgụ ahụ. Ọ zara ekpere ha nʼihi na ha tụkwasịrị ya obi.
1CH 5:21 Ha ji ike chịkọrọ anụ ụlọ ndị Haga, dị iri puku ịnyịnya kamel ise, narị puku atụrụ abụọ na iri puku ise, puku ịnyịnya ibu abụọ. Ha dọkpụkwara narị puku ndị mmadụ nʼagha.
1CH 5:22 E gbukwara ọtụtụ ndị mmadụ nʼihi na agha ahụ bụ nke Chineke lụrụ nʼonwe ya. Ha bichiri ala ahụ tutu ruo mgbe a dọọrọ Izrel niile nʼagha.
1CH 5:23 Ọkara ebo Manase dị ukwuu nʼọnụọgụgụ; ha nwere ebe obibi ha site nʼala Bashan ruo Baal-Hemon, ya bụ, ruo Senia, ugwu Hemon.
1CH 5:24 Ndịisi ikwu ha niile bụ ndị a: Efaa, Ishi, Eliel, Azriel, Jeremaya, Hodavaya na Jadiel. Ndị a niile bụ dimkpa nʼagha, ndị a ma ama na ndịisi ezinaụlọ.
1CH 5:25 Ma ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke nna nna ha. Kama ha merụrụ onwe ha site nʼife chi niile nke ndị bi nʼala ahụ na mbụ, bụ ndị Chineke lara nʼiyi nʼihu ha.
1CH 5:26 Nʼihi nke a, Chineke nke Izrel kpaliri mmụọ Pul, bụ eze Asịrịa (ya bụ Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa), ka o bilie megide ndị Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase, dọta ha nʼagha, buru ha gaa Hala, na Hoboa, na Hara na osimiri Gozan, ebe ha nọ ruo taa.
1CH 6:1 Livayị mụrụ ndị a: Geshọn, Kohat na Merari.
1CH 6:2 Kohat mụrụ Amram, Izha, Hebrọn na Uziel.
1CH 6:3 Amram mụrụ Erọn, Mosis na Miriam. Erọn mụrụ Nadab, Abihu, Elieza na Itama.
1CH 6:4 Elieza mụrụ Finehaz; Finehaz abụrụ nna Abishua
1CH 6:5 Abishua bụ nna Buki, Buki abụrụ nna Uzi.
1CH 6:6 Uzi mụrụ Zerahaya, Zerahaya amụọ Meraiot.
1CH 6:7 Meraiot mụrụ Amaraya, Amaraya amụọ Ahitub.
1CH 6:8 Ahitub mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Ahimaaz.
1CH 6:9 Ahimaaz mụrụ Azaraya, Azaraya amụọ Johanan.
1CH 6:10 Johanan mụrụ Azaraya ọ bụ ya bụ onye ahụ bụ onye nchụaja ụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn wuru na Jerusalem.
1CH 6:11 Azaraya mụrụ Amaraya, Amaraya amụọ Ahitub.
1CH 6:12 Ahitub mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Shalum.
1CH 6:13 Shalum mụrụ Hilkaya, Hilkaya amụọ Azaraya.
1CH 6:14 Azaraya mụrụ Seraya, Seraya amụọ Jehozadak,
1CH 6:15 A dọtara Jehozadak nʼagha mgbe Onyenwe anyị mere ka Nebukadneza dọkpụrụ ndị Juda na Jerusalem nʼagha.
1CH 6:16 Ụmụ ndị ikom Livayị bụ, Geshọm, Kohat na Merari.
1CH 6:17 Geshọm mụrụ Libni na Shimei.
1CH 6:18 Ụmụ Kohat bụ Amram, Izha, Hebrọn, na Uziel.
1CH 6:19 Merari mụtara Mahali na Mushi. Ndị a bụ ikwu Livayị ndị e depụtara dịka aha nna ha si dị.
1CH 6:20 Ikwu Geshọm bụ Libni, Jahat, Zima,
1CH 6:21 Joa, Ido, Zera na Jeaterai.
1CH 6:22 Ikwu Kohat bụ Aminadab, Kora, Asịa,
1CH 6:23 Elkena, Ebiasaf, Asịa,
1CH 6:24 Tahat, Uriel, Ụzaya na Shaul.
1CH 6:25 Ụmụ ụmụ Elkena bụ Amasai na Ahimot.
1CH 6:26 Ụmụ ụmụ Ahimot bụ Elkena, Zofai, Nahat,
1CH 6:27 Eliab, Jeroham, Elkena na Samuel.
1CH 6:28 Ụmụ Samuel bụ Juel, ọkpara ya, na Abija nke abụọ.
1CH 6:29 Ụmụ ụmụ Merari bụ Mahali, Libni, Shimei, Ụza,
1CH 6:30 Shimea, Hagiya na Asaya.
1CH 6:31 Ndị a bụ ndị ikom Devid họpụtara nye ọrụ ilekọta ndị ọbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ nʼebe ahụ.
1CH 6:32 Ha jere ozi ịbụ abụ ha nʼihu ụlọ ikwu, ya bụ, ụlọ nzute, tutu ruo mgbe Solomọn wuchara ụlọnsọ Onyenwe anyị na Jerusalem. Ha jere ozi ha dịka usoro ije ozi ha si dị.
1CH 6:33 Ndị a bụ ndị ikom ahụ jere ozi, ha na ụmụ ha ndị ikom: Site nʼikwu Kohat: Heman, ọbụ abụ. Ndị a bụ nna nna ya ochie: Juel, nwa Samuel,
1CH 6:34 nwa Elkena, nwa Jeroham, nwa Eliel, nwa Toa,
1CH 6:35 nwa Zuf, nwa Elkena, nwa Mahat, nwa Amasai,
1CH 6:36 nwa Elkena, nwa Juel, nwa Azaraya, nwa Zefanaya,
1CH 6:37 nwa Tahat, nwa Asịa, nwa Ebiasaf, nwa Kora,
1CH 6:38 nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livayị, nwa Izrel.
1CH 6:39 Asaf onye na-enyere Heman aka, na-eje ozi nʼakụkụ aka nri ya. Ndị bụ nna nna ya ochie bụ ndị a: Berekaya, nwa Shimea,
1CH 6:40 nwa Maikel, nwa Baaseya, nwa Malkija,
1CH 6:41 nwa Etni, nwa Zera, nwa Adaya,
1CH 6:42 nwa Etan, nwa Zima, nwa Shimei,
1CH 6:43 nwa Jahat, nwa Geshọm, nwa Livayị.
1CH 6:44 Onye ọzọ na-enyere Heman aka bụ Etan, onye ikwu Merari. Ọ na-anọ nʼaka ekpe ya. Ndị bụ nna nna ochie Etan bụ ndị a, Kishi, nwa Abdi, nwa Maluk,
1CH 6:45 nwa Hashabaya, nwa Amazaya, nwa Hilkaya,
1CH 6:46 nwa Amzi, nwa Bani, nwa Shema,
1CH 6:47 nwa Mahali, nwa Mushi, nwa Merari, nwa Livayị.
1CH 6:48 Ụmụnna ha ndị Livayị ụfọdụ ka e tinyere nʼọrụ dị iche iche nʼụlọ ikwu, bụ ụlọ Chineke.
1CH 6:49 Ma Erọn na ụmụ ụmụ ya bụ ndị chụrụ aja onyinye nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nakwa nʼelu ebe ịchụ aja ihe na-esi isi ụtọ, nke metụtara ọrụ ije ozi niile nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, na-ekpuchikwara Izrel mmehie niile ha, nʼusoro dịka ihe niile si dị nke Mosis ohu Chineke nyere nʼiwu.
1CH 6:50 Ụmụ ụmụ Erọn bụ Elieza, na Finehaz, na Abishua,
1CH 6:51 na Buki, na Uzi, na Zerahaya,
1CH 6:52 na Meraiot, na Amaraya, na Ahitub,
1CH 6:53 na Zadọk, na Ahimaaz.
1CH 6:54 Ndị a bụ ala na obodo dị iche iche ụmụ Erọn ketara, nke e nyere ikwu Kohat, ụmụ ụmụ Erọn, nʼihi na ọ bụ ha ka e bu ụzọ kenye oke site nʼife nza.
1CH 6:55 Hebrọn, nʼime Juda, ya na ala ịta nri anụ ụlọ niile dị ya gburugburu.
1CH 6:56 Ma ala ubi na obodo nta niile gbara Hebrọn gburugburu ka e nyere Kaleb nwa Jefune.
1CH 6:57 Ya mere e nyere ụmụ ụmụ Erọn Hebrọn (obodo mgbaba), na Libna, na Jatịa, na Eshtemoa,
1CH 6:58 na Hilen, na Debịa,
1CH 6:59 na Ashan, na Juta, na Bet-Shemesh, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
1CH 6:60 Site nʼebo Benjamin e nyere ha obodo Gibiọn, Geba, Alemet, na Anatot, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. Obodo ndị a, nke e kere nʼetiti ndị ikwu Kohat, dị iri na otu nʼọnụọgụgụ.
1CH 6:61 E fere nza tupu e nye ndị fọdụrụ nʼime ikwu Kohat obodo iri site nʼala ọkara ebo Manase.
1CH 6:62 E fekwara nza nye agbụrụ niile dị nʼikwu Geshọm obodo iri na atọ na Bashan, site nʼala ebo Isaka, na Asha, na Naftalị, na agbụrụ niile dị nʼikwu Manase.
1CH 6:63 E fekwara nza nye ikwu Merari obodo iri na abụọ site nʼala ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.
1CH 6:64 Otu a ka ndị Izrel si nye ndị Livayị obodo ndị a na ebe ịta nri nke anụ ụlọ dị.
1CH 6:65 Site nʼebo Juda, na Simiọn, na Benjamin ka e si kenye ha obodo ndị ahụ a kpọrọ aha ha na mbụ.
1CH 6:66 E sitere nʼala ndị ebo Ifrem kenye ụfọdụ nʼime ndị agbụrụ Kohat obodo ụfọdụ.
1CH 6:67 Nʼala ugwu ugwu Ifrem e kenyere ha Shekem (obodo mgbaba), na Gaza,
1CH 6:68 na Jokmeam, na Bet-Horon,
1CH 6:69 na Aijalon, na, Gat Rimọn, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara ya gburugburu.
1CH 6:70 Site nʼọkara ebo Manase, ndị Izrel nyere ndị ikwu Kohat fọdụrụ obodo ndị a: Anea na Bileam, tinyere ala ebe ịta nri anụ ụlọ ha.
1CH 6:71 Ndị Geshọm natara obodo ndị a: Site nʼagbụrụ ọkara ebo Manase ha natara Golan, nke dị na Bashan, na Ashtarọt, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
1CH 6:72 Ebo Isaka nyere ha Kedesh, Daberat,
1CH 6:73 Ramọt na Anem, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ niile dị ha gburugburu.
1CH 6:74 Ebo Asha nyere ha Mashal, Abdon,
1CH 6:75 Hukọk na Rehob, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ niile dị ha gburugburu.
1CH 6:76 Ebo Naftalị nyere ha Kedesh nʼime Galili, Hamọn na Kiriatem, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
1CH 6:77 Ndị ebo Zebụlọn nyere ụmụ Merari ndị Livayị fọdụrụ ala ndị a: Jokneam, Kata, Rimọn na Taboa, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ ha.
1CH 6:78 Ma nʼofe osimiri Jọdan, nʼọwụwa anyanwụ obodo Jeriko, ndị ebo Ruben nyere ha obodo Beza dị nʼọzara, nyekwa ha Jahaz,
1CH 6:79 Kedemot na Mefaat, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha niile.
1CH 6:80 Ndị ebo Gad nyere ha Ramọt nke Gilead, Mahanaim,
1CH 6:81 Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha niile.
1CH 7:1 Isaka mụrụ ụmụ anọ: Tola, na Pua, na Jashub, na Shịmrọn.
1CH 7:2 Ụmụ Tola ndị ghọrọ ndịisi ezi bụ ndị a: Uzi, na Refaya, na Jeriel, na Jamai, na Ibsam, na Samuel. Nʼoge Devid bụ eze, ọnụọgụgụ ndị agha sitere nʼetiti ha dị iri puku abụọ na abụọ, na narị isii. (22,600).
1CH 7:3 Uzi mụrụ Izrahaya. Izrahaya amụta ndị a: Maikel, Ọbadaya, Juel na Ishaya. Ha niile bụkwa ndịisi ikwu ha.
1CH 7:4 Ndị bụ ndị agha nʼetiti ụmụ ụmụ ha nʼoge Devid bụ eze ruru iri puku atọ na isii (36,000), nʼihi na ha niile lụrụ ọtụtụ ndị inyom, mụọ ọtụtụ ụmụ.
1CH 7:5 Ụmụnne ha bụ ndị na-alụ agha bụ ndị agbụrụ Isaka dị iri puku asatọ na asaa (87,000) nʼọnụọgụgụ, dịka e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
1CH 7:6 Benjamin mụrụ ndị ikom atọ: Bela, Beka na Jediael,
1CH 7:7 Bela mụrụ ụmụ ise: Ezbon, Uzi, Uziel, Jerimot na Iri. Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị agha ha dị iri puku abụọ na abụọ na iri atọ na anọ (22,034). E dekwara aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
1CH 7:8 Ụmụ ndị ikom Beka mụrụ bụ Zemira, Joash, Elieza, Elioenai, Omri, Jeremot, Abija, Anatot na Alemet.
1CH 7:9 Akwụkwọ ebe e dere usoro ọmụmụ ha depụtara aha ndịisi ezinaụlọ, na iri puku ndị agha abụọ na narị abụọ (20,200).
1CH 7:10 Jediael mụrụ otu nwa nwoke: aha ya bụ Bilhan. Ụmụ Bilhan bụ Jeush, Benjamin, Ehud, Kenaana, Zetan, Tashish na Ahishaha.
1CH 7:11 Ụmụ ndị ikom Jediael ndị a bụ ndịisi ezinaụlọ. E nwere nʼetiti ha ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asaa na narị abụọ (17,200), ndị nọ na njikere ibu agha.
1CH 7:12 Ndị Shupim na ndị Hupim bụ ụmụ ụmụ Er ebe ndị Hushim bụ ụmụ ụmụ Aha.
1CH 7:13 Ụmụ Naftalị mụtara bụ Jaziel, Guni, Jeza na Shalum bụ ụmụ Bilha.
1CH 7:14 Ụmụ Manase: Asriel, onye iko ya nwanyị bụ onye Aram mụtara, na Makia. Makia bụ nna Gilead.
1CH 7:15 Makia sitere nʼetiti ndị Hupim na Shupim lụọ nwunye. Aha nwanne ya nwanyị bụ Maaka. Otu onye ọzọ si nʼagbụrụ Manase bụ Zelofehad, onye mụtara naanị ụmụ ndị inyom.
1CH 7:16 Maaka nwunye Makia mụtara otu nwa nwoke ọ gụrụ Peresh. Aha nwanne ya bụ Sheresh, onye mụtara Ụlam na Rakem.
1CH 7:17 Nwa nwoke Ụlam mụtara bụ Bedan. Ndị a bụ ụmụ Gilead, nwa nwa Makia, nwa Manase.
1CH 7:18 Hamoleket, nwanne nwanyị Makia mụrụ Ishod, Abieza na Mahla.
1CH 7:19 Shemida mụrụ ụmụ ikom ndị a: Ahian, Shekem, Liiki na Aniam.
1CH 7:20 Ụmụ Ifrem bụ Shutela, Bered, Tahat, Eleada, Tahat
1CH 7:21 na Zabad nwa ya, na Shutela nwa ya. Eza na Elead bụ ndị gara ịchịkọrọ anụ ụlọ ndị Gat, ndị ikom nwe obodo ahụ jidere ha gbuo ha nʼebe ahụ.
1CH 7:22 Ifrem nna ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ọnwụ ha, ma ụmụnna ya kasịrị ya obi.
1CH 7:23 Mgbe nwunye ya mụrụ nwa nwoke ọzọ, ọ kpọrọ aha ya Beriya, nke pụtara, Ihe ndaba ọjọọ, nʼihi ọnwụ Elead na Eza.
1CH 7:24 Aha nwa Ifrem nke nwanyị bụ Sheera. Sheera bụ onye wuru akụkụ ugwu na ndịda Bet-Horon, wuokwa Uzen-Sheera.
1CH 7:25 Ndị a bụkwa ụmụ Ifrem: Refa, nna Reshef, onye bụ nna Tela. Tela bụ nna Tahan,
1CH 7:26 onye bụ nna Ladan, Ladan bụ nna Amihud, onye bụ nna Elishama.
1CH 7:27 Elishama bụ nna Nun, onye bụ nna Joshua.
1CH 7:28 Betel na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ya bụ Naaran, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na Gaza na obodo nta ya, ndị dị nʼọdịda anyanwụ, na Shekem, na obodo ndị ọzọ, tutu ruo Aya, na obodo nta ya niile, so nʼala ha.
1CH 7:29 Ụmụ Manase, nwa Josef, nwa nwa Izrel, bikwa nʼobodo ndị a dị nʼoke ala ha: Bet-Shan, na Teanak, na Megido, na Doa, tinyere obodo nta ha niile.
1CH 7:30 Asha mụrụ ndị a: Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwa ya nwanyị bụ Sera.
1CH 7:31 Beriya amụta ndị a: Heba na Malkiel, onye bụ nna Biazait.
1CH 7:32 Heba bụ onye mụrụ Jaflet, Shoma na Hotam. Nwanne ha nwanyị bụ Shua.
1CH 7:33 Ụmụ Jaflet mụrụ bụ Pasak, Bimhal na Ashvat. Ndị a bụ ụmụ Jaflet.
1CH 7:34 Shoma amụọ Ahi, Roga, Huba na Aram.
1CH 7:35 Nwanne ya nwoke Helem mụrụ Zofa, Imana, Shelesh na Amal.
1CH 7:36 Zofa amụta ndị a: Sua, Hanefa, Shual, Beri, Imra,
1CH 7:37 Beza, Hod, Shama, Shilsha, Itran na Beera.
1CH 7:38 Jeta mụtara Jefune, Pispa na Ara.
1CH 7:39 Ụla amụta Ara, Haniel na Rizia.
1CH 7:40 Ụmụ ụmụ Asha ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị a sara anya na mmiri họpụta, ndị bụ dimkpa nʼagha, ndị ndu a ma ama. Ọnụọgụgụ ndị ha tozuru ije agha dị puku iri abụọ na isii (26,000), ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
1CH 8:1 Benjamin mụtara ụmụ ndị ikom ise. Aha ha nʼusoro dịka e si mụọ ha bụ: Bela nke mbụ, nke abụọ Ashbel, nke atọ Ahara,
1CH 8:2 nke anọ Noha, na nke ise Rafa.
1CH 8:3 Ndị ikom Bela mụrụ bụ Aada, Gera, Abihud,
1CH 8:4 Abishua, Neeman, Ahoa,
1CH 8:5 Gera, Shefufan na Huram.
1CH 8:6 Ụmụ Ehud ndị bụ ndịisi ezinaụlọ na Geba, ndị bụkwa ndị e si na Geba chụpụ mee ka ha gaa biri na Manahat bụ ndị a:
1CH 8:7 Neeman, Ahija na Gera, onye chụpụrụ ha na onye bụkwa nna Ụza na Ahihud.
1CH 8:8 A mụtara Shaharaim ụmụ ndị ikom na Moab mgbe ọ gbachara ndị nwunye ya abụọ bụ Hushim na Baara alụkwaghị m.
1CH 8:9 Nwunye ya Hodesh mụtara Jobab, Zibịa, Mesha, Malkam,
1CH 8:10 Jeuz, Sakia na Miama. Ndị a bụ ụmụ ya ndị ikom, ndị bụkwa ndịisi ezi.
1CH 8:11 Tupu ọ chụpụ nwunye ya Hushim, ọ mụtaara ya Abaịtub, na Elpaal.
1CH 8:12 Elpaal mụrụ ndị a: Eba, Misham, Shemed (onye wuru obodo Ono na Lod, na obodo nta gbara ha gburugburu).
1CH 8:13 Ụmụ ya ndị ọzọ bụ Beriya, na Shema, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ ndị bi nʼAijalon. Ọ bụ ha chụpụrụ ndị Gat site nʼobodo ahụ.
1CH 8:14 Beriya mụrụ Ahio, Shashak, Jeremot,
1CH 8:15 Zebadaya, Arad, Eda,
1CH 8:16 Maikel, Ishpa na Joha, ndị a bụ ụmụ ndị ikom Beriya.
1CH 8:17 Zebadaya, Meshulam, Hizki, Heba,
1CH 8:18 Ishmerai, Izlaya na Jobab bụ ụmụ Elpaal.
1CH 8:19 Jakim, Zikri, Zabdi,
1CH 8:20 Elienai, Ziletai, Eliel,
1CH 8:21 Adaya, Beraya na Shimrat bụ ụmụ Shimei.
1CH 8:22 Ishpan, Eba, Eliel,
1CH 8:23 Abdon, Zikri, Hanan,
1CH 8:24 Hananaya, Elam, Antotija,
1CH 8:25 Ifdeya na Penuel bụ ụmụ ndị ikom Shashak.
1CH 8:26 Jeroham mụrụ Shamsherai, Sheharaya, Atalaya,
1CH 8:27 Jaareshaya, Ịlaịja na Zikri bụ ụmụ ndị ikom Jeroham.
1CH 8:28 Ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị ndu, ndị bi na Jerusalem, ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
1CH 8:29 Jeiel nna Gibiọn biri na Gibiọn. Aha nwunye ya bụ Maaka.
1CH 8:30 Ọ mụrụ Abdon, ọkpara ya, Zua, Kish, Baal, Nea, Nadab,
1CH 8:31 Gedoa, Ahio na Zeka
1CH 8:32 na Miklot, onye bụ nna Shimea. Ha onwe ha bikwa ndị ụmụnna ha nso na Jerusalem.
1CH 8:33 Nea mụrụ Kish, nna Sọl. Ma Sọl mụrụ Jonatan, Malkishua, Abinadab na Esh-Baal.
1CH 8:34 Jonatan mụrụ nwa nwoke a na-akpọ Merib-Baal, nna Maịka.
1CH 8:35 Ụmụ Maịka mụrụ bụ, Piton, Melek, Tarea na Ehaz.
1CH 8:36 Ehaz amụọ Jehoada nna Alemet, Azmavet na Zimri. Zimri mụrụ Moza.
1CH 8:37 Moza mụrụ Binea, nna Rafa, nna Eleasa, nna Azel.
1CH 8:38 Azel mụrụ ụmụ ndị ikom isii ndị a: Azrikam, Bokeru, Ishmel, Shearaya, Ọbadaya na Hanan. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Azel.
1CH 8:39 Eshek nwanne nwoke Azel mụrụ ndị ikom atọ: Ụlam, ọkpara ya na Jeush, na Elifelet.
1CH 8:40 Ụmụ Ụlam bụ dike na dimkpa ndị a zụrụ ịgba ụta. Ọnụọgụgụ ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha dị otu narị na iri mmadụ ise, 150. Ha niile sikwa nʼebo Benjamin.
1CH 9:1 E dere usoro ọmụmụ ụmụ Izrel niile nʼime akwụkwọ ndị eze Izrel na Juda. Emesịa, a dọọrọ ha nʼagha buru ha gaa Babilọn nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
1CH 9:2 Nʼime ndị a, ndị bụ ụzọ lọta bịa birikwa nʼihe onwunwe ha nʼobodo nke aka ha bụ ụfọdụ ndị Izrel, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu.
1CH 9:3 Ndị si nʼebo Juda, na Benjamin, na Ifrem na Manase lọta bịa biri na Jerusalem bụ ndị a:
1CH 9:4 Utai nwa Amihud, nwa Omri, nwa Imri, nwa Bani, onye ikwu Perez, nwa Juda.
1CH 9:5 Nʼezinaụlọ Shilo: Asaya nwa mbụ ya na ụmụ ya ndị ikom.
1CH 9:6 Ụmụ Zera, Jeuel so nʼime ha. Ọnụọgụgụ ndị Juda niile lọtara dị narị isii na iri itoolu (690).
1CH 9:7 Ụmụ Benjamin: Salu nwa Meshulam, nwa Hodavaya, nwa Hasenua;
1CH 9:8 na Ibneia nwa Jeroham; Elaa nwa Uzi, nwa Mikri; na Meshulam nwa Shefataya, nwa Reuel, nwa Ibnija.
1CH 9:9 Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị Benjamin niile lọtara ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ha, dị narị itoolu na iri ise na isii (956).
1CH 9:10 Ndị nchụaja: Jedaya, Jehoiarib na Jakin;
1CH 9:11 Azaraya nwa Hilkaya, nwa Meshulam, nwa Zadọk, na Meraiot, nwa Ahitub. Azaraya bụ onye na-elekọta ụlọnsọ ukwu Chineke.
1CH 9:12 Ndị nchụaja ọzọ lọtaranụ bụ Adaya nwa Jeroham, nwa Pashua, nwa Malkija. Onye ọzọ bụ Maasai nwa Adiel, nwa Jazera, nwa Meshulam nwa Meshilemit, nwa Imea
1CH 9:13 Ọnụọgụgụ ndị nchụaja lọtaranụ bụ otu puku na narị asaa, na iri isii (1,760). Ha niile bụkwa ndịisi ezinaụlọ, ndị tozuru etozu ịrụ ọrụ ha, ndị ọrụ ha bụ ije ozi nʼụlọnsọ Chineke.
1CH 9:14 Ndị Livayị: Shemaya nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaya onye ikwu Merari.
1CH 9:15 Bakbaka, Heresh, Galal, na Matanaya nwa Mika, nwa Zikri, nwa Asaf;
1CH 9:16 Ọbadaya nwa Shemaya, nwa Galal, nwa Jedutun; na Berekaya nwa Asa, nwa Elkena onye biri nʼobodo nta ndị Netofa.
1CH 9:17 Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ si nʼebo Livayị: Shalum, onyeisi ha, Akub, Talmon, Ahiman na ụmụnna ha.
1CH 9:18 Ha nọ ruo ugbu a nʼọnụ ụzọ ama Eze, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ha bụ ndị nche ọnụ ụzọ ama si nʼọmụma ụlọ nke ndị Livayị.
1CH 9:19 Shalum bụ nwa Kore, na nwa nwa Ebiasaf na Kora. Ya na ụmụnna ya ka ọ bụ ọrụ ha ilekọta ebe a na-eje ozi, na ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ dịka nna nna ha lekọtara, cheekwa ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.
1CH 9:20 Finehaz nwa Elieza bụ onyeisi ndị mbụ rụrụ ọrụ a na mgbe ochie, Onyenwe anyị nọnyekwaara ya.
1CH 9:21 Mgbe ahụ, Zekaraya nwa Meshelemaia bụ onye na-elekọta ọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ ikwu.
1CH 9:22 Ọnụọgụgụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nche nʼoge ahụ bụ narị abụọ na iri na abụọ (212). E depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nke obodo nta ha. Ndị nche ọnụ ụzọ ama ndị a bụ ndị Devid na Samuel onye amụma họpụtara nye ha ọnọdụ a nʼihi na-atụkwasịrị ha obi.
1CH 9:23 Ha na ụmụ ụmụ ha ka e tinyere ya nʼaka iche ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.
1CH 9:24 Ha na-eche akụkụ anọ ya niile, ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ, ugwu na ndịda.
1CH 9:25 Ụbọchị asaa ka ha na-anọ nʼọrụ a. Emesịa, ụmụnna ha na-abịa gbanwee ha. Ya mere, ha na-agbanwe onwe ha ụbọchị asaa asaa.
1CH 9:26 Ma ndịisi nche ọnụ ụzọ ama anọ ndị ahụ bụ ndị Livayị ka esitere nʼịtụkwasị obi nyefee ọrụ ilekọta ime ụlọ niile nakwa ụlọakụ niile dị nʼime ụlọ Chineke nʼaka.
1CH 9:27 Ha na-eche nche gburugburu ụlọnsọ Chineke abalị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka ọ dị nʼaka iche ya nche. Ọ bụkwa ha ka e nyefere ọrụ imeghe ya ụtụtụ niile.
1CH 9:28 Ụfọdụ nʼime ha ka ọ dị nʼaka ilekọta ngwongwo e ji achụ aja. Ha na-agụ ya ọnụ mgbe ọbụla e webatara ya, na mgbe ọbụla a na-ewepụ ya.
1CH 9:29 Ndị ọzọ na-elekọta ihe niile e ji chọọ ụlọnsọ ahụ mma, ya na ụtụ ọka, na mmanya, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda dị iche iche.
1CH 9:30 Ma ọ bụ ndị nchụaja ndị ọzọ ka e nyere ọrụ ịsụ, ịgwakọta na ịkpụkọta ụda na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
1CH 9:31 Matitaia, onye Livayị, ọkpara Shalum, onye ikwu Kora, ka esitere na ntụkwasị obi nyefee ya ọrụ ime achịcha onyinye.
1CH 9:32 Ụfọdụ nʼime ndị ikwu Kohat ka ọ dị nʼaka ime achịcha pụrụ iche, a na-adọkwasị nʼelu tebul, nʼụbọchị izuike niile.
1CH 9:33 Ndị ọbụ abụ, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị na-anọgide nʼime ọnụụlọ ndị dị nʼụlọnsọ ukwu nʼihi na e kweghị ka ha rụọ ọrụ ọzọ ebe ọ bụ na ha na-arụ ọrụ ịbụ abụ ehihie na abalị niile.
1CH 9:34 Ha niile bụ ndịisi ezinaụlọ nʼebo Livayị. Ndị ndu dịka e depụtakwara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ha bikwa na Jerusalem.
1CH 9:35 Jeiel nna Gibiọn bụ na Gibiọn ka o bi, Aha nwunye ya bụ Maaka.
1CH 9:36 Ọ mụrụ Abdon, ọkpara ya, Zua, Kish, Baal, Nea, Nadab,
1CH 9:37 Gedoa, Ahio, Zekaraya na Miklot.
1CH 9:38 Miklot bụ nna Shimeam. Ha onwe ha sokwa ụmụnna ha biri na Jerusalem.
1CH 9:39 Nea mụrụ Kish nna Sọl, onye bụ nna Jonatan, Malkishua, Abinadab na Esh-Baal.
1CH 9:40 Jonatan mụrụ Merib-Baal nna Maịka.
1CH 9:41 Maịka mụrụ Piton, Melek, Tahrea na Ehaz.
1CH 9:42 Ehaz mụrụ Jada. Jada bụ nna Alemet, Azmavet na Zimri. Zimri mụrụ Moza.
1CH 9:43 Moza mụrụ Binea, nna Refaya, nna Eleasa, nna Azel.
1CH 9:44 Azel mụrụ ụmụ isii: Azrikam, Bokeru, Ishmel, Shearaya, Ọbadaya na Hanan. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Azel.
1CH 10:1 Nʼoge a ndị Filistia lụsoro ndị Izrel agha, ndị Izrel si nʼihu ha gbaa ọsọ, ma ọtụtụ nʼime ha nwụrụ nʼugwu Gilboa.
1CH 10:2 Ndị Filistia ji ike chụso Sọl na ụmụ ya. Ha gburu ụmụ ya ndị ikom, Jonatan, Abinadab na Malkishua.
1CH 10:3 Agha ahụ siri ike nke ukwuu megide Sọl, mgbe ndị na-agba ụta chụkwutere ya ha merụrụ ya ahụ.
1CH 10:4 Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya.
1CH 10:5 Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, nwụọkwa.
1CH 10:6 Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ nwụrụ, ndị niile si nʼụlọ ya nwụkwara nʼotu mgbe ahụ.
1CH 10:7 Mgbe ndị Izrel niile nọ na ndagwurugwu hụrụ na ndị agha agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha.
1CH 10:8 Nʼechi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom ka ha tọgbọ nʼugwu Gilboa.
1CH 10:9 Ha yipụrụ ya ihe niile oyi, buru isi ya na ihe agha ya, zipụkwa ndị ozi gara nʼala ndị Filistia niile ikwusa akụkọ ihe mere nye ndị ha niile na arụsị ha niile.
1CH 10:10 Ha tinyere ihe agha ya nʼụlọ chi ha, kwụbakwa okpokoro isi ya nʼụlọ Dagọn.
1CH 10:11 Mgbe ndị Jebesh Gilead niile nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl,
1CH 10:12 ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, biliri gaa buru ozu Sọl na ụmụ ya, bulata ha na Jebesh. Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi ukwu dị na Jebesh, buo ọnụ ụbọchị asaa.
1CH 10:13 Sọl nwụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya nye Onyenwe anyị, o debeghị okwu Onyenwe anyị, karịsịa, ọ gara na nke onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, nʼihi ịjụta ya ase,
1CH 10:14 ma ọ jụghị ase site nʼọnụ Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere Onyenwe anyị ji gbuo ya, were alaeze ya nyefee Devid nwa Jesi nʼaka.
1CH 11:1 Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute Devid na Hebrọn sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ.
1CH 11:2 Nʼoge gara aga, ọ bụladị mgbe Sọl bụ eze, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị bụ Chineke gị, sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’ ”
1CH 11:3 Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere eze Devid na Hebrọn, ya na ha gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere ya mmanụ ịbụ eze Izrel, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa site nʼọnụ Samuel.
1CH 11:4 Devid na ndị Izrel zọọrọ ije garuo Jerusalem nke bụ Jebus. Ma ndị Jebus bi nʼebe ahụ,
1CH 11:5 gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a.” Nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid.
1CH 11:6 Devid ekwuolarị sị, “Onye ọbụla buru ụzọ buo agha megide ndị Jebus ga-abụ onyeisi ọchịagha ndị agha.” Joab nwa Zeruaya bụ onye mbụ gara, nʼihi ya, o nwetara ike ịbụ ọchịagha.
1CH 11:7 Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ya obodo Devid.
1CH 11:8 O wuru obodo gburugburu ya, site na Milo ruo na mgbidi gbara ya gburugburu. Ma Joab wuzikwara akụkụ obodo ahụ nke fọdụrụ.
1CH 11:9 Ma Devid gara nʼihu na-adị ukwuu karịa, nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nọnyeere ya.
1CH 11:10 Ndị a bụ ndịisi ndị dike nʼetiti ndị agha Devid. Ha na ndị Izrel niile nyere ịchị eze Devid ezi nkwado ime ka ọchịchị ya ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa.
1CH 11:11 Nke a bụ ndekọ ọnụọgụgụ ndị dike nʼagha Devid nwere: Jashobeam, onye Hakmon, bụ onyeisi nʼetiti ndịisi ndị ọzọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha.
1CH 11:12 Onye nke na-eso ya bụ Elieza nwa Dodayi, onye Ahohi, onye bụ otu nʼime ndị dike atọ ndị ahụ.
1CH 11:13 Ya na Devid nọ na Pas Damin mgbe ndị Filistia zukọrọ nʼebe ahụ ibu agha. Nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara nʼọka balị, ma ndị agha Izrel si nʼọgbọ agha gbapụ ọsọ nʼihi ndị Filistia.
1CH 11:14 Ma ha were ọnọdụ ha nʼetiti ubi ahụ, ha napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu.
1CH 11:15 Mmadụ atọ nʼime iri ndịisi agha atọ ahụ jekwuru Devid na nkume dị nʼọgba Adulam, na mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim.
1CH 11:16 Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha ndị Filistia dị na Betlehem.
1CH 11:17 Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu, ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!”
1CH 11:18 Ya mere, ha atọ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala dịka onyinye nye Onyenwe anyị, kwuo sị,
1CH 11:19 “Chineke ekwela ka m mee nke a. M ga-aṅụ ọbara ndị ikom a, bụ ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Nʼihi na ha ji ndụ ha chụọ aja ịga kute ya, Devid ekweghị aṅụ ya. Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara.
1CH 11:20 Abishai, nwanne Joab bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a, ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a.
1CH 11:21 Nʼetiti mmadụ atọ ahụ, a na-asọpụrụ ya karịa, ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.
1CH 11:22 Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha, kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya.
1CH 11:23 O tigburu otu nwoke onye Ijipt, nke ogologo ya dị mita abụọ na ọkara. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe buru ezigbo ibu nʼaka, nke okporo ya dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya, pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị ya nʼaka, jiri ya magbuo ya.
1CH 11:24 Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ ahụ.
1CH 11:25 A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche.
1CH 11:26 Ndị bụ dike nʼagha bụ ndị a: Asahel nwanne Joab, Elhanan nwa Dodo onye Betlehem,
1CH 11:27 Shamot onye Haroa, Helez onye Pelon,
1CH 11:28 Ira nwa Ikesh, onye Tekoa, Abieza onye Anatot,
1CH 11:29 Sibekai onye Husha, Ilai onye Ahohi,
1CH 11:30 Maharai onye Netofa, Heled nwa Baana, onye Netofa,
1CH 11:31 Itai nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin, Benaya onye Piraton,
1CH 11:32 Hurai onye si nʼakụkụ iyi dị na Gaash, Abiel onye Arba,
1CH 11:33 Azmavet onye Baharum, Eliaba onye Shaalbon,
1CH 11:34 Ụmụ Hashem onye Gizon, Jonatan nwa Shagee, onye Hara,
1CH 11:35 Ahiam nwa Saka, onye Hara, Elifal nwa Ụọ,
1CH 11:36 Hefa onye Mekerat, Ahija onye Pelon,
1CH 11:37 Hezro onye Kamel, Naarai nwa Ezbai,
1CH 11:38 Juel nwanne Netan, Miba nwa Hagri,
1CH 11:39 Zelek onye Amọn, Naharai onye Beerọt, onye na-ebu ngwa agha Joab, nwa Zeruaya,
1CH 11:40 Ira onye Itra, Gareb onye Itra,
1CH 11:41 Ụraya onye Het, Zabad nwa Alai,
1CH 11:42 Adina nwa Shiza, onye Ruben, onye bụ onyeisi ebo Ruben na iri mmadụ atọ ahụ na-eso ya.
1CH 11:43 Hanan nwa Maaka, Joshafat onye Mitna,
1CH 11:44 Ụzia onye Ashterat, Shama na Jeiel ụmụ Hotam, onye Aroea,
1CH 11:45 Jediael nwa Shimri, Joha nwanne ya, onye Tiza,
1CH 11:46 Eliel onye Mahavi, Jeribai na Joshavia ụmụ Elnaam, Itma onye Moab,
1CH 11:47 Eliel, Obed, na Jaasiel onye Mezoba.
1CH 12:1 Ndị a bụ ndị ikom bịakwutere Devid na Ziklag, mgbe e si nʼihu Sọl nwa Kish chụpụ ya. (Ha so nʼime ndị ọka agha nyeere Devid aka ibu agha.
1CH 12:2 Ngwa agha ha bụ ụta, ha nwere ike iji aka nri maọbụ aka ekpe gbapụ àkụ maọbụ fee ebe; ndị a bụ ndị ikwu Sọl si nʼebo Benjamin.)
1CH 12:3 Onyeisi ha bụ Ahieza na Joash, bụ ụmụ Shema onye Gibea. Ndị ọzọ bụ, Jeziel na Pelet ụmụ Azmavet, Beraka, Jehu onye Anatot,
1CH 12:4 Ishmaya onye Gibiọn, dimkpa nʼetiti iri mmadụ atọ ndị ahụ, onye bụ onyendu iri mmadụ atọ ahụ, Jeremaya, Jahaziel, Johanan, Jozabad onye Gedera,
1CH 12:5 Eluzai, Jerimot, Bealia, Shemaraya, na Shefataya onye Haruf;
1CH 12:6 Elkena, Ishaya, Azarel, Joeza na Jashobeam, ndị Kora;
1CH 12:7 Juela na Zebadaya ụmụ Jeroham onye Gedoa.
1CH 12:8 Ndị a bụkwa dike nʼagha sitere nʼebo Gad gbasoo Devid nʼebe e wusiri ike ya dị nʼọzara. Ha bụkwa ndị ọka nʼiji ùbe na ọta alụ agha. Ha dịkwa gara gara dịka ele nʼelu ugwu, ihu ha dịkwa ka ihu ọdụm.
1CH 12:9 Eza, bụ onyeisi ha. Ọbadaya bụ onye na-eso ya, tupu Eliab esoro.
1CH 12:10 Onye nke anọ bụ Mishmana. Ndị ọzọ nʼusoro ha bụ, Jeremaya,
1CH 12:11 na Atai bụ nke isii, na Eliel bụ nke asaa,
1CH 12:12 na Johanan bụ nke asatọ, na Elzabad bụ nke itoolu,
1CH 12:13 na Jeremaya onye nke iri, nakwa Makbanai onye nke iri nʼotu.
1CH 12:14 Ndị a, ndị sitere nʼebo Gad bụ ndịisi agha. Onye na-adịghị ike nʼime ha dị ike dịka narị ndị agha, ma onye dị ike nʼime ha dị ike dịka puku ndị agha.
1CH 12:15 Ọ bụ ha gafere osimiri Jọdan nʼudu mmiri, mgbe Jọdan tofere akụkụ ya niile, chụsaa ndị niile bi na ndagwurugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.
1CH 12:16 Ndị ọzọ sitekwara nʼebo Benjamin na Juda bịakwute Devid nʼebe ya e wusiri ike.
1CH 12:17 Mgbe ahụ, Devid pụrụ ịga zute ha, sị ha, “Ọ bụrụ na unu bịara nʼudo inyere m aka, ejikeere m ịnabata unu ka unu dịnyere m. Kama ọ bụrụkwanụ na unu bịara ịrara m nye nʼaka ndị iro m, ebe aka m dị ọcha, ka Chineke nna nna anyị hụ ihe dị unu nʼobi kpee unu ikpe.”
1CH 12:18 Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ dakwasịrị Amasai, onyendu iri ndị ikom atọ ahụ, mee ka ọ gwa Devid okwu sị ya, “Anyị bụ ndị gị, Devid! Anyị so gị nʼazụ, gị nwa Jesi! Udo, udo ga-abụ nke gị, udo ga-abụkwa nke ndị na-enyere gị aka, nʼihi na Chineke gị na-enyere gị aka.” Ya mere, Devid nabatara ha mee ha ndịisi agha na-apụnara ndị mmadụ ihe.
1CH 12:19 Ụfọdụ nʼime ndị ebo Manase gbasooro Devid, mgbe ọ gara sonyere ndị Filistia nʼịlụso Sọl ọgụ. Ma ya na ndị agha ya enyereghị ndị Filistia aka, nʼihi na mgbe ndị Filistia gbachara izu, ndị ndu ndị Filistia zilagara ya. Ha kwuru sị, “Isi anyị ka anyị ga-atụfu ma ọ bụrụ na Devid ahapụ anyị nʼọgbọ agha gbakwuru nna ya ukwu bụ Sọl.”
1CH 12:20 Mgbe Devid gara Ziklag, ndị a bụ ndị ikom si nʼebo Manase ndị gbasooro ya: Adna, Jozabad, Jediael, Maikel, Jozabad, Elihu na Ziletai. Ndị a niile bụ ndịisi agha na-achị puku ndị agha nʼebo Manase.
1CH 12:21 Ha nyeere Devid aka imegide ndị agha nkwata ahụ, nʼihi na ha niile bụ dike nʼagha, bụrụkwa ndịisi agha.
1CH 12:22 Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọtụtụ ndị ikom na-agbafeta soro Devid, tutu ruo mgbe ha ghọrọ igwe ndị agha, ndị agha nke Chineke.
1CH 12:23 Ndị a bụ ndị jikeere ibu agha, ndị chịkwa ngwa agha bịakwute Devid na Hebrọn, nʼihi na ha chọrọ ka ọ bịa bụrụ eze ha nʼọnọdụ Sọl, dịka Onyenwe anyị kwuru.
1CH 12:24 Ndị sitere nʼebo Juda, ndị bu ọta na ùbe ha dị puku isii na narị asatọ. (6,800)
1CH 12:25 Ndị Simiọn a maara aha ha nʼibu agha dị puku asaa na otu narị. (7,100)
1CH 12:26 Ndị Livayị dị puku anọ na narị isii. (4,600),
1CH 12:27 tinye Jehoiada, onyendu nʼezinaụlọ Erọn na puku ndị ikom atọ na narị asaa (3,700),
1CH 12:28 na Zadọk, nwokorobịa bụ dike na dimkpa nʼagha, onyendu ndịisi agha iri abụọ na abụọ (22) ndị si nʼezinaụlọ ya.
1CH 12:29 Ụmụ Benjamin, ndị ikwu Sọl, dị puku atọ (3,000), nʼihi na nʼoge a, ọtụtụ ha nọnyeere Sọl.
1CH 12:30 Ụmụ Ifrem dị iri puku abụọ na narị asatọ (20,800), ndị dị ike nʼagha, ndị a makwaara aha ha nʼikwu ha.
1CH 12:31 Site nʼọkara ebo Manase, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ (18,000) ka a họpụtara ịga inyere Devid aka ịbụ eze.
1CH 12:32 Ụmụ Isaka; narị ndịisi abụọ (200), na ndị ha na-edu. Ndịisi a bụ ndị nwere nghọta oge ha nọ nʼime ya marakwa ihe Izrel kwesiri ime nʼoge ahụ.
1CH 12:33 Ụmụ Zebụlọn dị iri puku ise. (50,000) Ha enweghị obi abụọ ọbụla iso Devid. A zụkwara ha nʼiji ụdị ngwa agha ọbụla na-ebu agha.
1CH 12:34 Ọnụọgụgụ ndị ndu ụmụ Naftalị dị otu puku (1,000), tinyere ndị agha dị puku iri atọ na asaa (37,000), ndị ji ùbe na ọta.
1CH 12:35 Ụmụ Dan dị iri puku abụọ na asatọ, na narị isii. (28,600) Ha bụkwa ndị agha jikeere ibu agha.
1CH 12:36 Ụmụ Asha dị iri puku anọ (40,000). Ha bụ ndị ibu agha doro nnọọ anya.
1CH 12:37 Sitekwa nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, site nʼebo Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase bi, ndị agha ọnụọgụgụ ha dị narị puku na iri abụọ (120,000), ndị ji ụdị ngwa agha ọbụla pụtara soro Devid. Ha bukwa ngwa agha ha pụta.
1CH 12:38 Ndị a niile bụ ndị agha na-eje ozi nʼusoro ndị ji obi ha pụta. Ha nwekwara mkpebi mgbe ha si ebe ọbụla ha si pụta ịbịa Hebrọn ime Devid eze. Ndị Izrel niile jikwa otu obi pụta ime Devid eze Izrel.
1CH 12:39 Mgbe ha pụkwutere Devid, ha so ya rie, ṅụọ, abalị atọ. Ọ bụkwa ihe ndị ezinaụlọ ha kwadoro ha ji bịa ka ha riri.
1CH 12:40 Ndị Isaka, na Zebụlọn, na Naftalị si ebe dị anya bute nri. Ịnyịnya ibu, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya muul na ehi ka ha ji bute nri ndị a. Ọ bụkwa nri dị iche iche ka ha butere, dịka ụtụ ọka, na achịcha e ji mkpụrụ fiig mee, na achịcha ndị ọzọ dị iche, na mmanya, na mmanụ, na igwe ehi, na igwe atụrụ. Ha si otu a bute nri ndị a nʼihi na oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile.
1CH 13:1 Devid na ndịisi agha ya na-achị imerime puku ndị agha, na ọtụtụ narị ndị agha, zukọrọ gbaa izu.
1CH 13:2 Ọ gwara ọgbakọ Izrel niile ahụ sị, “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, ọ bụrụkwa na ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị Chineke anyị, ka anyị ziga ozi zie ụmụnna anyị niile bi nʼakụkụ niile nke ala Izrel, na ndị nchụaja na ndị Livayị niile, bi nʼobodo ha na ndị bi nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, ka ha bịa, soro anyị.
1CH 13:3 Ka anyị gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼihi na e lefuru ya anya nʼoge ahụ niile Sọl bụ eze.”
1CH 13:4 Ha niile kwekọrịtara ime nke a nʼihi na okwu ahụ dị ndị niile zukọrọ mma.
1CH 13:5 Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ndị Izrel niile oku ka ha zuo ezuo site nʼebe niile ha bi, site nʼoke ala ha na ndị Ijipt, ya bụ iyi Shiho, ruo nʼoke ala dị nʼugwu, ya bụ Lebo Hamat, ka ha gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke site na Kiriat Jearim.
1CH 13:6 Devid na ndị Izrel niile jere Baala nʼime Juda, ya bụ Kiriat Jearim, i si nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, bụ Onyenwe anyị, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim, igbe ahụ nke akpọkwasịrị aha ya.
1CH 13:7 Ha ji ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ buru igbe ọgbụgba ndụ Chineke site nʼụlọ Abinadab, Ụza na Ahio na-eduzi ụgbọala ahụ ụzọ.
1CH 13:8 Devid na ndị Izrel niile weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Chineke, jiri abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na iti egwu na-etekwa egwu.
1CH 13:9 Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Kidon, Ụza setịpụrụ aka ya ijide igbe ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ.
1CH 13:10 Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, o tigburu ya nʼihi na o metụrụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ aka. Ya mere, ọ nwụrụ nʼebe ahụ nʼihu Chineke.
1CH 13:11 Mgbe ahụ, iwe were Devid nʼihi ọnụma Onyenwe anyị dakwasịrị Ụza, ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza.
1CH 13:12 Devid tụrụ egwu Chineke nʼụbọchị ahụ, o kwuru sị, “M ga-esi aṅaa bubatara onwe m igbe ọgbụgba ndụ a?”
1CH 13:13 O bubataghị igbe ọgbụgba ndụ ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git.
1CH 13:14 Igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ nọrọ nʼezinaụlọ Obed-Edọm nʼụlọ ya ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere.
1CH 14:1 Hiram bụ eze Taịa zitere Devid ndị ozi, na ndị ọkwa ǹka osisi na ndị na-edo nkume, ka ha nyere Devid aka iwu ụlọeze ya. O nyekwara ya osisi sida o ji ewu ụlọ ahụ.
1CH 14:2 Devid ghọtara na Onyenwe anyị emeela ka o guzosie ike dịka eze ndị Izrel, na ebuliela alaeze ya elu nke ukwuu nʼihi ndị ya Izrel.
1CH 14:3 Devid lụrụ ndị inyom ọzọ mgbe o jere biri na Jerusalem. Nke a mere ka ọ mụọ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị.
1CH 14:4 Ndị a bụkwa aha ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn,
1CH 14:5 Ibha, Elishua, Elpelet,
1CH 14:6 Noga, Nefeg, Jafia,
1CH 14:7 Elishama, Beeliada na Elifelet.
1CH 14:8 Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel niile, ha pụrụ nʼigwe ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, jikere pụọ izute ha.
1CH 14:9 Ma ndị Filistia bịara, bukọrọ ihe niile dị na Ndagwurugwu Refaim.
1CH 14:10 Devid jụrụ Chineke ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, aga m enyefe ha nʼaka gị.”
1CH 14:11 Ya mere, Devid na ndị ikom ya gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Chineke enupula megide ndị iro m site nʼaka m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal Perazim.
1CH 14:12 Ndị Filistia hapụrụ chi niile ha nʼebe ahụ, Devid nyere iwu ka e suo ha niile ọkụ.
1CH 14:13 Ndị Filistia bukwara agha bịa na ndagwurugwu ahụ ọzọ.
1CH 14:14 Nʼihi nke a, Devid jụrụ Chineke ase ọzọ. Chineke sịrị ya, “Esitekwala nʼihu buso ha agha, kama gbaa ha gburugburu, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ.
1CH 14:15 Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mgbe ahụ ka unu ga-apụ ibu agha, nʼihi na nke a pụtara na Chineke eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.”
1CH 14:16 Devid mere dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Ha tigburu ndị agha Filistia site na Gibiọn ruo Gaza.
1CH 14:17 Ya mere, aha Devid bidoro na-ewu ewu; Onyenwe anyị tinyekwara ụjọ ya nʼobi mba niile.
1CH 15:1 Mgbe Devid wuchara ụlọ obibi ya nʼobodo Devid, o doziri ebe a ga-adọsa igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ọ mara ụlọ ikwu maka ya.
1CH 15:2 Devid kwuru sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ebu igbe Chineke karịakwa ndị Livayị, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara ha ibu igbe Onyenwe anyị na ije ozi nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.”
1CH 15:3 Ya mere, Devid kpọkọtara ndị Izrel niile, na Jerusalem ibubata igbe Onyenwe anyị nʼebe ahụ ọ kwadoro na a ga-adọsa ya.
1CH 15:4 Ọ kpọkọtara ụmụ Erọn na ndị Livayị:
1CH 15:5 Ndị Kohat na ụmụnna ha dị otu narị na iri abụọ. (120) Uriel bụ onyeisi ha.
1CH 15:6 Ụmụ Merari na ụmụnna ha dị narị abụọ na iri abụọ. (220) Asaya bụ onyeisi ha.
1CH 15:7 Ụmụ Geshọm na ụmụnna ha dị otu narị na iri atọ. (130) Juel bụ onyeisi ha.
1CH 15:8 Ụmụ Elizafan na ụmụnna ha dị narị abụọ (200). Shemaya bụ onyeisi ha.
1CH 15:9 Ụmụ Hebrọn na ụmụnna ha dị iri asatọ. (80) Eliel bụ onyeisi ha.
1CH 15:10 Ụmụ Uziel na ụmụnna ha dị otu narị na iri na abụọ. (112) Aminadab bụ onyeisi ha.
1CH 15:11 Devid kpọrọ Zadọk na Abịata, ndị nchụaja na Uriel, Asaya, Juel, Shemaya, Eliel, na Aminadab ndị Livayị sị ha,
1CH 15:12 “Unu bụ ndịisi ezinaụlọ dị iche iche, nʼebo Livayị. Doonụ onwe unu nsọ unu na ụmụnna unu ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel nʼebe a m doziri nʼihi ya.
1CH 15:13 Na mbụ, Onyenwe anyị Chineke tara anyị ahụhụ nʼihi na anyị esoghị omenaala ime ka unu bụ ndị Livayị buru ya. Anyị ajụtaghị ya ase otu a ga-esi bulata ya nʼụzọ o kwesiri.”
1CH 15:14 Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị mezuru omenaala ido onwe ha nsọ maka ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel ahụ.
1CH 15:15 Ndị Livayị jiri osisi ogologo buru igbe Chineke ahụ nʼisi ubu aka ha dịka Mosis nyere nʼiwu nʼusoro dịka okwu Onyenwe anyị si dị.
1CH 15:16 Devid nyekwara ndị ndu Livayị iwu sị ka ha họpụta site nʼetiti ụmụnna ha ndị abụ na ndị egwu, ndị ga-abụ abụ ọṅụ, nke ya na ngwa egwu ndị a ga-eso: ụbọ akwara, une na ogene.
1CH 15:17 Ndị Livayị họpụtara Heman nwa Juel; ma site nʼetiti ụmụnna Juel ha họpụtara Asaf, nwa Berekaya. Sitekwa nʼetiti ụmụnna ha ndị Merari ha họpụtara Etan nwa Kushaya,
1CH 15:18 tinyere ndị a, ha họpụtara ụmụnna ha ndị a, ndị na-esote ha nʼọkwa: Zekaraya, Jaaziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Benaya, Maaseia, Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm na Jeiel bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.
1CH 15:19 Heman, Asaf na Etan ka a họpụtara maka ịkụ ogene bronz.
1CH 15:20 Zekaraya na Aziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Maaseia na Benaya bụ ndị na-akpọ ụbọ akwara dịka usoro abụ alamot, si dị
1CH 15:21 Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm, Jeiel na Azazaya bụkwa ndị na-akpọ une dịka usoro abụ Sheminit si dị.
1CH 15:22 Onyeisi ndị na-abụ abụ a họpụtara bụ Kenaniya, onye bụkwa onyeisi ndị Livayị. A họpụtara ya nʼihi na ọ bụ onye nwere nghọta banyere abụ.
1CH 15:23 Berekaya na Elkena bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị.
1CH 15:24 Shebanaya, Joshafat, Netanel, Amasai, Zekaraya, Benaya na Elieza, ndị bụ ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Obed-Edọm na Jehaya ga-esokwa ndị ga-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị nche.
1CH 15:25 Devid na ndị okenye Izrel, na ndịisi agha na-achị puku ndị agha, ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ.
1CH 15:26 Nʼihi na Chineke nyeere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị aka, ọ bụ oke ehi asaa na ebule asaa ka a chụrụ nʼaja.
1CH 15:27 Ọ bụ ezi akwa ọcha ka e ji kee Devid ekike, dịka ndị Livayị niile bụ ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na ndị ọbụ abụ, na Kenaniya, bụ onyeisi otu ndị na-abụ abụ yi akwa ọcha nʼahụ ha. Devid yikwa uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ.
1CH 15:28 Ya mere, ndị Izrel niile ji iti mkpu, na-ịfụ opi mpi ebule na-ịfụ opi ike, ịkpọ ụbọ akwara, ịkụ ogene na une, bulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
1CH 15:29 Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal nwa Sọl, lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-ayọrị egwu na-aṅụrị ọṅụ, o ledara ya anya nʼime obi ya.
1CH 16:1 Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ guzobe ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Ha chekwara aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu Chineke.
1CH 16:2 Mgbe Devid chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị.
1CH 16:3 O nyekwara onye ọbụla nʼIzrel, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ.
1CH 16:4 Ọ họpụtara ụfọdụ ndị Livayị ka ha nọdụ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ inye Onyenwe anyị, Chineke Izrel ekele na otuto na ịrịọ ya ngọzị nʼisi ndị ya Izrel. Ndị a bụ ndị o nyere ije ozi a:
1CH 16:5 Asaf bụ onyeisi ndị a. Ndị ọzọ bụ Zekaraya, Jeiel, Shemiramot, Jehiel, Matitaia, Eliab, Benaya, Obed-Edọm na Jeiel. Ọrụ ha bụ ịkpọ ụbọ akwara, na une, ma ọrụ Asaf bụ onye na-akụ ogene ọla na-ada ụda.
1CH 16:6 Benaya na Jahaziel, ndị nchụaja, ketara ọrụ ịfụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke kwamgbe kwamgbe.
1CH 16:7 Nʼụbọchị ahụ ka Devid buru ụzọ họpụta Asaf na ndị otu ya ka ha nye Onyenwe anyị otuto nʼusoro dị otu a:
1CH 16:8 Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya, meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
1CH 16:9 Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto; kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya niile.
1CH 16:10 Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa ọṅụ.
1CH 16:11 Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile.
1CH 16:12 Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile nke si nʼọnụ ya pụta.
1CH 16:13 Unu, ụmụ Izrel, bụ ohu ya ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.
1CH 16:14 Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile.
1CH 16:15 Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi; bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ.
1CH 16:16 Ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara, na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
1CH 16:17 O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
1CH 16:18 Sị, “Aga m enye gị ala Kenan ka ọ bụrụ ihe nketa gị.”
1CH 16:19 Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, nʼezie, ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼala ahụ.
1CH 16:20 Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa mba ọzọ, sitekwa nʼotu alaeze gaa na alaeze ọzọ.
1CH 16:21 O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ; ọ baara ndị eze mba nʼihi ha, sị:
1CH 16:22 “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka, unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”
1CH 16:23 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.
1CH 16:24 Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.
1CH 16:25 Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụkwa onye kachasị ka e nye otuto. Onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.
1CH 16:26 Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.
1CH 16:27 Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na ọṅụ dị nʼebe obibi ya.
1CH 16:28 Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.
1CH 16:29 E, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya, werenụ onyinye bịa nʼihu ya. Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya.
1CH 16:30 Maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile. Elu ụwa niile kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya.
1CH 16:31 Ka eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka ha kwupụta nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.”
1CH 16:32 Ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya, ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ.
1CH 16:33 Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ, ka ha bụọ abụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe.
1CH 16:34 Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
1CH 16:35 Tikuonụ ya mkpu sị, “Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị; chịkọta anyị, ma napụtakwa anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele; ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.”
1CH 16:36 Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu Onyenwe anyị.”
1CH 16:37 Devid hapụrụ Asaf na ndị Livayị ibe ya nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ ụbọchị niile ije ozi mgbe niile, dịka ọrụ ụbọchị ọbụla si dị.
1CH 16:38 Obed-Edọm nwa Jedutun so nʼime ha, ya na Hosa, na iri mmadụ isii na asatọ ọzọ. Obed-Edọm nwa Jedutun na Hosa bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.
1CH 16:39 Devid nyefekwara Zadọk, onye nchụaja, na ndị nchụaja ibe ya, ọrụ ịnọ nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị, nʼebe dị elu nke Gibiọn.
1CH 16:40 Nʼihi ịchụ aja nsure ọkụ mgbe niile nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ụtụtụ na anyasị niile nʼusoro dịka e si dee ya nʼakwụkwọ iwu Onyenwe anyị, nke o nyere ndị Izrel.
1CH 16:41 Devid họpụtakwara Heman, na Jedutun, na ndị ọzọ a kpọrọ aha họpụta inye Onyenwe anyị ekele, “nʼihi ịhụnanya ya na obi ebere ya nke na-adị ruo mgbe ebighị ebi.”
1CH 16:42 Heman na Jedutun bụ ndị ọ dịịrị ịfụ opi, na ịkụ ogene ọla, na ihe egwu ndị ọzọ eji na-enye Chineke otuto. Ụmụ ndị ikom Jedutun bụ ndị nọ nche nʼọnụ ụzọ ama.
1CH 16:43 Mgbe mmemme ahụ gwụsịrị, onye ọbụla lara nʼụlọ ya. Devid lakwara ịgọzi ezinaụlọ ya.
1CH 17:1 Mgbe Devid nọsara ahụ nʼụlọeze ya, ọ sịrị Netan onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị dị nʼokpuru ụlọ ikwu.”
1CH 17:2 Netan zaghachiri Devid, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi, mee ya, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.”
1CH 17:3 Ma nʼabalị ahụ, okwu Chineke rutere Netan ntị, na-asị,
1CH 17:4 “Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: Gị onwe gị agaghị ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi,
1CH 17:5 nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta Izrel ruo taa. Kama e sitela m nʼotu ọmụma ụlọ ikwu baa na nke ọzọ, sitekwa nʼotu ebe obibi gaa ebe nke ọzọ.
1CH 17:6 Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ndu ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?” ’
1CH 17:7 “Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị, mee gị onye na-achị ndị m Izrel.
1CH 17:8 Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa.
1CH 17:9 Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha, ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ,
1CH 17:10 dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m eme ka ndị iro gị niile nọrọ nʼokpuru gị. “ ‘Ana m ekwupụtara gị na Onyenwe anyị ga-ewuru gị ụlọ.
1CH 17:11 Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe ị gakwuru ndị nna nna gị ha, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, ọ ga-abụ otu nʼime ụmụ ndị ị mụrụ. Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike.
1CH 17:12 Ọ bụ ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ, aga m emekwa ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
1CH 17:13 Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna, ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Agaghị m ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m mere onye bu gị ụzọ chịa.
1CH 17:14 Aga m eme ka ọ chịa ụlọ m na nʼalaeze m ruo mgbe ebighị ebi. A ga-emekwa ka ocheeze ya bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ”
1CH 17:15 Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị.
1CH 17:16 Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị: “Onye ka m bụ, Onyenwe anyị Chineke, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a?
1CH 17:17 O Chineke m, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị, ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị. Ma gị onwe gị Onyenwe anyị Chineke na-ele m anya dịka a ga-asị na m bụ onye ọnọdụ ya dị elu karịchasịa nke ụmụ mmadụ niile.
1CH 17:18 “Gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị, nʼihi nsọpụrụ i nyere ohu gị? Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma,
1CH 17:19 O Onyenwe anyị, nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ọ mata nkwa ndị a niile dị ukwuu.
1CH 17:20 “Onyenwe anyị, ọ dịghị onye dịka gị, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị.
1CH 17:21 Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa ndị Chineke ha gara ịgbapụtara onwe ya ka ọ bụrụ otu ndị, na iji mere onwe gị aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt?
1CH 17:22 I mere ka ndị gị Izrel bụrụ ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Gị onwe gị kwa, Onyenwe anyị, abụrụla Chineke ha.
1CH 17:23 “Ma ugbu a, Onyenwe anyị, mee ka nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya bụrụ nke ga-eguzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị,
1CH 17:24 ka o nwee ike guzosie ike. Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-asị, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke na-achị Izrel, bụ Chineke Izrel.’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị Devid guzosie ike nʼihu gị.
1CH 17:25 “Gị onwe gị, Chineke m, e kpugheerela ohu gị na ị ga-ewuru ya ụlọ. Ya mere, ohu gị ji nwee obi ike ikpere gị ekpere.
1CH 17:26 Gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Chineke. I kweekwala ohu gị nkwa ihe ọma ndị a.
1CH 17:27 Ugbu a, ọ masịrị gị ịgọzi ụlọ ohu gị, ime ka ọ dịrị na-aga nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi na gị Onyenwe anyị, agọziela ya. Ọ ga-abụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.”
1CH 18:1 Mgbe nke a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia, mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Gat na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu site nʼaka ndị Filistia.
1CH 18:2 Devid merikwara ndị Moab, ha ghọrọ ndị ohu ya, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.
1CH 18:3 Devid merikwara Hadadeza eze Zoba, na nso Hamat, mgbe ọ na-aga iguzobe ogidi eji mara ya nʼakụkụ osimiri Yufretis.
1CH 18:4 Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.
1CH 18:5 Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha.
1CH 18:6 O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs, ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwara ya ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
1CH 18:7 Devid chịkọtara ọta ọlaedo nke ndịisi agha Hadadeza na-ebu na Jerusalem.
1CH 18:8 Site na Tibhat nakwa Kun, bụ obodo ndị Hadadeza na-achị, Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu, nke Solomọn ji kpụọ Osimiri bronz ahụ, ogidi niile na ngwongwo ndị ọzọ niile nke e ji bronz kpụọ.
1CH 18:9 Mgbe Tou eze Hamat nụrụ na Devid emeriela ndị agha niile nke Hadadeza, eze Zoba,
1CH 18:10 o zipụrụ Hadoram nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee eze Devid nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Hadoram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaedo, nke ọlaọcha na nke bronz dị iche iche bịa.
1CH 18:11 Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o mere ọlaọcha na ọlaedo o wetara na mba ndị a: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek.
1CH 18:12 Abishai nwa Zeruaya gburu puku ndị Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu.
1CH 18:13 O wuru ogige ndị agha nʼEdọm, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
1CH 18:14 Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi.
1CH 18:15 Joab nwa Zeruaya bụ onyeisi agha ya; Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta akụkọ.
1CH 18:16 Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja. Shavsha bụ ode akwụkwọ eze.
1CH 18:17 Benaya nwa Jehoiada bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndịisi nʼọrụ eze.
1CH 19:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Nahash eze ndị Amọn nwụrụ, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
1CH 19:2 Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere nʼihi na nna ya gosiri m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya. Mgbe ndị ozi Devid bịakwutere Hanọn nʼala ndị Amọn ịkasị ya obi,
1CH 19:3 ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn, bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na ndị ozi ya abịakwuteghị gị, naanị ka ha mee nledo, nyochapụta otu obodo a dị ma kwatuo ya?”
1CH 19:4 Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ ha ajị, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha.
1CH 19:5 Mgbe otu onye bịara zie Devid ihe banyere ndị ikom ahụ, o zipụrụ ndị ozi, ka ha gaa zute ha, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko tutu ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.”
1CH 19:6 Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, Hanọn na ndị Amọn zipụrụ otu puku talenti ọlaọcha iji gbazite ụgbọ agha na ndị na-agba ụgbọ agha site na Aram Naharaim, na Aram Maaka, nakwa Zoba.
1CH 19:7 Ha goro ụgbọ agha ọnụọgụgụ ya dị iri puku atọ, na puku abụọ. Ha gokwara eze Maaka na ndị agha ya, ndị bịara maa ụlọ ikwu agha ha na nso Medeba, ebe ndị Amọn sikwa nʼobodo ha niile chịkọta onwe ha pụta ịlụ agha.
1CH 19:8 Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha.
1CH 19:9 Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha. Ma ndị eze ahụ bịara agha, nọpụrụ onwe ha na mbara ala.
1CH 19:10 Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram.
1CH 19:11 O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, e zipụrụ ha izute ndị Amọn nʼagha.
1CH 19:12 Mgbe Abishai na-apụ, Joab gwara ya okwu sị ya, “Ọ bụrụ na ndị Aram esie ike karịa m, mgbe ahụ, ị ga-abịa napụta m. Ọ bụrụkwanụ na ndị Amọn adịrị ike karịa gị, aga m abịa napụta gị.
1CH 19:13 Nwee obi ike, ka anyị lụọ ọgụ a dịka ndị dị ike, nʼihi ndị anyị na obodo niile nke Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị meekwa ihe dị mma nʼanya ya.”
1CH 19:14 Mgbe ahụ, Joab na ndị agha so ya bịara nso ibuso ndị Aram agha, ha sitere nʼihu ha gbapụ ọsọ.
1CH 19:15 Mgbe ndị Amọn hụrụ ka ndị Aram na-agbapụ ọsọ, ha onwe ha gbakwaara ọsọ nʼihu Abishai, gbaba nʼime obodo. Ya mere, Joab laghachiri na Jerusalem.
1CH 19:16 Ma mgbe ndị Aram hụrụ na ndị Izrel tigburu ha, ha zipụrụ ndị ozi gara kpọta ndị Aram site nʼofe ọzọ nke Osimiri Yufretis. Ọ bụ Shofaka ọchịagha ndị agha Hadadeza na-edu ha.
1CH 19:17 Mgbe a gwara Devid banyere nke a, ọ chịkọtara ndị Izrel niile, pụọ gafee Jọdan. O gara nso imegide ha, o doro usoro agha ya na ncherita ihu ha. Devid doro usoro ndị agha ya izute ndị Aram nʼagha, ha lụsokwara ya agha.
1CH 19:18 Ma ha sitere nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ. Devid gburu puku asaa nʼime ndị ikom na-anya ụgbọ agha, gbukwaa iri puku ndị agha anọ ndị na-eji ụkwụ eje. O gbukwara Shofaka, bụ ọchịagha agha ha.
1CH 19:19 Mgbe ndị eze niile nọ nʼokpuru ọchịchị Hadadeza hụrụ na Izrel etigbuola ha, ha mere ka ha na Devid dịrị nʼudo, bụrụkwa ndị nọ nʼokpuru ya. Ya mere, ndị Aram adịghịkwa njikere inyere ụmụ Amọn aka ọzọ.
1CH 20:1 Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Joab duuru ndị agha pụọ ibu agha. O bibiri ala ndị Amọn niile, gaa Raba nọchibido ya, ma Devid nọdụrụ na Jerusalem. Joab busoro Raba agha, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe.
1CH 20:2 Devid kpupuru okpueze nke dị eze ha nʼisi, ahụtara nʼịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma, e kpunyere ya Devid nʼisi. O sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.
1CH 20:3 Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala, na anyụike na-arụ. Otu a ka Devid mekwara obodo niile nke ndị Amọn. Emesịa, Devid na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.
1CH 20:4 Mgbe oge gatụrụ, agha ọzọ daara ha na ndị Filistia, na Gaza. Mgbe ahụ, Sibekai, onye Husha, gburu Sipai, otu nʼime ndị agbụrụ Refaim. Nke a mere ka ndị Filistia chilie aka ha elu, bụrụ ndị a lụgburu nʼagha.
1CH 20:5 Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ, Elhanan, nwa Jaịa, gburu Lami nwanne Golaịat, onye Gat. Onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa.
1CH 20:6 Nʼagha ọzọkwa, bụ nke a lụrụ na Gat, e nwere otu nwoke gbara oke dimkpa, nke nwere mkpịsịaka isii nʼaka ya ọbụla, nweekwa mkpịsịụkwụ isii nʼụkwụ ya ọbụla, ya bụ, a gụkọtaa ha niile, iri mkpịsịaka na mkpịsịụkwụ abụọ na anọ. Ọ bụkwa onye amụrụ nʼagbụrụ Rafa.
1CH 20:7 Mgbe ọ kọchara Izrel, Jonatan nwa Shimea, nwanne Devid gburu ya.
1CH 20:8 Ndị a bụ ndị agbụrụ Rafa dị na Gat. Devid na ndị agha ya gburu ha niile.
1CH 21:1 Ekwensu biliri megide Izrel, mgbe ọ kpaliri Devid ka ọ gụọ Izrel ọnụ.
1CH 21:2 Ya mere, Devid gwara Joab na ndịisi agha okwu sị, “Gaa gụọ ụmụ Izrel niile ọnụ, site na Bịasheba ruo Dan. Emesịa, bịa gwa m ihe ị gụtara ka m mata ole ọnụọgụgụ ha dị.”
1CH 21:3 Ma Joab zaghachiri, “Ka Onyenwe anyị mee ka ndị agha ya mụbaa, otu onye narị ụzọ karịa. Ma onyenwe m eze, ọ bụ na ndị a niile abụghị ndị nọ nʼokpuru ọchịchị onyenwe m? Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achọ ime ihe a? Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji wetara Izrel ikpe ọmụma?”
1CH 21:4 Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab. Ya mere, Joab pụrụ gagharịa nʼIzrel niile, mechaa lọghachikwa na Jerusalem.
1CH 21:5 Joab nyere Devid ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel niile. NʼIzrel niile, ha dị otu nde, na narị puku ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, tinyekwara narị puku ndị ikom anọ na iri asaa nʼala Juda ndị na-amịpụta mma agha.
1CH 21:6 Ma Joab agụnyeghị ndị Livayị, na ndị Benjamin nʼọnụọgụgụ ahụ, nʼihi na iwu eze amasịghị ya nʼobi nʼụzọ ọbụla.
1CH 21:7 Iwu banyere ọnụọgụgụ a adịghịkwa Chineke mma nʼanya. Ya mere, ọ tara ndị Izrel ahụhụ nʼihi ya.
1CH 21:8 Mgbe ahụ, Devid sịrị Chineke, “Emehiela m nke ukwuu site nʼihe a m mere. Ma ugbu a, biko, arịọ m gị, wezuga ikpe ọmụma dịịrị ohu gị; nʼihi na emeela m ihe nzuzu dị ukwuu.”
1CH 21:9 Onyenwe anyị gwara Gad, onye ọhụ ụzọ Devid, sị,
1CH 21:10 “Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’ ”
1CH 21:11 Ya mere Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, Họrọ nke dị gị mma.
1CH 21:12 Oke ụnwụ nke ga-adị afọ atọ, ka ọ bụ ọnwa atọ nke mkpochapụ nʼihu ndị iro unu, site na mma agha ha ga-eru unu ahụ, ka ọ bụ ụbọchị atọ nke mma agha Onyenwe anyị, bụ ajọ ọrịa na-efe efe ịda nʼala a, nke mmụọ ozi Onyenwe anyị ga-eme ka ọ bịakwasị ala Izrel niile. Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.”
1CH 21:13 Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ọ ka mma ka m daba nʼaka Onyenwe anyị karịa ịdaba nʼaka mmadụ. Nʼihi na obi ebere ya bara ụba nke ukwuu.”
1CH 21:14 Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ajọ ọrịa na-efe efe nʼala Izrel, iri puku ndị ikom asaa dara nwụọ.
1CH 21:15 Chineke zipụrụ mmụọ ozi ị ga bibie Jerusalem, ma dịka mmụọ ozi ahụ na-eme nke a, Onyenwe anyị hụrụ ya, o wutere ya nʼihi mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-ebibi ndị mmadụ, “O zuola! Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị na-eguzo nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus.
1CH 21:16 Mgbe Devid leliri anya elu hụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzo nʼetiti mbara eluigwe na ụwa, hụkwa mma agha o ji, nke o chere ihu ya na Jerusalem, ya na ndị okenye Izrel yi akwa mkpe, dara nʼala kpuo ihu nʼala.
1CH 21:17 Devid sịrị Chineke, “Ọ bụghị m nyere iwu ka a gụọ ndị tozuru ibu agha ọnụ? Ọ bụ mụ onwe m, mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mehiere mee ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? Onyenwe anyị Chineke m, biko ekwela ka ọrịa a na-efe efe nọgide nʼahụ ndị gị, ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.”
1CH 21:18 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere Gad iwu ka ọ gwa Devid, ka ọ gaa wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus.
1CH 21:19 Ya mere, Devid rubere isi gaa dịka okwu ahụ Gad kwuru nʼaha Onyenwe anyị.
1CH 21:20 Mgbe Arauna nọ nʼebe ịzọcha ọka, ọ tụgharịrị hụ mmụọ ozi ahụ, ụmụ ya ndị ikom anọ ndị so ya guzo nʼebe ahụ zoro onwe ha.
1CH 21:21 Mgbe Devid bịakwutere Arauna, Arauna weliri anya hụ ya, ọ hapụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ, bịa kpọọ isiala nye Devid, kpudokwa ihu ya nʼala.
1CH 21:22 Devid sịrị ya, “Nye m ebe a, bụ ala ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja, ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ. Resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru.”
1CH 21:23 Ma Arauna zara sị Devid, “Were ya ka onyenwe m eze mee ihe ọbụla dị ya nʼobi. Aga m enye ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, ihe nzọcha ọka niile ka ha bụrụ nkụ na ọka wiiti maka ịchụ aja mkpụrụ ọka. Aga m enye ha niile.”
1CH 21:24 Ma eze Devid zaghachiri Arauna, “ee, aghaghị m ịkwụzu gị ọnụahịa ya. Nʼihi na agaghị m ewere ihe bụ nke gị nye ya Onyenwe anyị, maọbụ chụọ aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.”
1CH 21:25 Ya mere, Devid kwụrụ Arauna narị shekel ọlaedo isii iji zụrụ ebe ahụ.
1CH 21:26 Devid wuru ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ, chụọkwa aja nsure ọkụ na aja udo. Ọ kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zakwara ya, site nʼọkụ nke si nʼeluigwe daa nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ.
1CH 21:27 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere mmụọ ozi ahụ iwu ka o tinyekwa mma agha ya nʼọbọ ya.
1CH 21:28 Mgbe Devid hụrụ na Onyenwe anyị azala ekpere ya nʼebe ịzọcha ọka nke Arauna onye Jebus, ọ chụkwara aja ọzọ nye Onyenwe anyị.
1CH 21:29 Ụlọ ikwu Onyenwe anyị na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ Mosis wuru nʼọzara dị nʼebe dị elu Gibiọn, nʼoge ahụ.
1CH 21:30 Ma Devid ejerughị ebe ahụ ịjụta Chineke ase, nʼihi na ụjọ tụrụ ya mgbe ọ hụrụ mma agha ahụ dị nʼaka mmụọ ozi Onyenwe anyị.
1CH 22:1 Mgbe ahụ, Devid sịrị, “Ebe a ka a ga-ewuru Onyenwe anyị Chineke ụlọ, nakwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Izrel.”
1CH 22:2 Ya mere, Devid nyere iwu ka a kpọkọta ndị ọbịa niile bi nʼIzrel, site nʼetiti ha ọ họpụtara ndị ga-edozi nkume a wara awa nke e ji wuo ụlọ Chineke.
1CH 22:3 Devid wetara ọtụtụ igwe dị ukwuu, nke ha ji akpụta ǹtu maka ibo ọnụ ụzọ ama niile, na nke ịkpụ ihe njikọta niile. O wetakwara bronz a na-apụghị ịkọwa ịdị arọ ya.
1CH 22:4 O webatakwara osisi sida nʼapụghị ịgụta ọnụọgụgụ ha, nʼihi na ndị Taịa na Saịdọn butere ha nʼọnụọgụgụ riri nne nye Devid.
1CH 22:5 Mgbe ahụ, Devid kwuru, “Solomọn nwa m bụ nwantakịrị, onye na-amachabeghị ihe. Ma ụlọnsọ a ga-ewuru Onyenwe anyị ga-abụ ụlọ dị ukwuu, nke ga-enwe aha a ma ama, na nke mara ezi mma nʼanya mba niile dị nʼụwa. Nʼihi ya, aga m akpakọba ihe niile e ji ewu ya.” Ya mere, tupu Devid anwụọ, ọ kwakọtara ngwongwo riri nne.
1CH 22:6 Ọ kpọrọ Solomọn, bụ nwa ya, nye ya iwu iwuru Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel ụlọ.
1CH 22:7 Devid gwara Solomọn sị, “Nwa m, ọ dị m nʼobi iwu ụlọ maka aha Onyenwe anyị bụ Chineke m,
1CH 22:8 ma okwu Onyenwe anyị ndị a ruru m ntị sị m, ‘Ị wụsịala ọtụtụ ọbara, bukwaa ọtụtụ agha. Ị gaghị ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị wụsịala ọtụtụ ọbara nʼelu ala nʼihu m.
1CH 22:9 Ma ị ga-amụta otu nwa nwoke onye ga-abụ mmadụ udo, na onye ga-enwe izuike nʼoge ya. Aga m enye ya izuike site nʼaka ndị iro ya nʼakụkụ niile. Aha ya ga-abụ Solomọn. Aga m enye Izrel udo na ahụ dị jụụ nʼoge ọchịchị ya.
1CH 22:10 Ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ ahụ. Ọ ga-abụrụ m nwa, mụ onwe m ga-abụkwara ya nna. Aga m emekwa ka ocheeze alaeze ya nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’
1CH 22:11 “Ya mere, ugbu a nwa m, ka Onyenwe anyị nọnyere gị mgbe ị ga-ewu ụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, dịka o kwuru na ị ga-eme.
1CH 22:12 Onyenwe anyị nyekwa gị amamihe na nghọta nke ị ga-eji chịa ezi ọchịchị mgbe ị ghọrọ eze Izrel, ka i si otu a debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị.
1CH 22:13 Mgbe ahụ, ị ga-enwe ọganihu, ma ọ bụrụ na i lezie anya idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị nyere Mosis maka Izrel. Dị ike, nwee obi ike. Atụla ụjọ, maọbụ daa mba.
1CH 22:14 “Ejisiela m ike chịkọtaa ihe maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, narị puku talenti ọlaedo na nde talenti ọlaọcha, na igwe, na bronz, nke a na-apụghị ịgụta ịdị arọ ha, na osisi, na nkume. I nwere ike itinyekwa ihe ndị ọzọ nʼime ha.
1CH 22:15 Lee, i nwekwara ọtụtụ ndị ọrụ ndị na-awa nkume, na ndị na-edo nkume, na ndị ọka osisi, na ndị a maara aha ha nʼihe gbasara ǹka nʼọrụ dị iche iche,
1CH 22:16 ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, ndị ọrụ nʼenweghị ọnụọgụgụ. Onyenwe anyị aghaghị ịnọnyere gị. Bilie, rụọ ọrụ dịịrị gị.”
1CH 22:17 Devid nyere ndịisi Izrel iwu ka ha nyere nwa ya Solomọn aka, mgbe ọ ga-ewu ụlọ ahụ.
1CH 22:18 Ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ na Onyenwe anyị Chineke anọnyereghị unu? Ọ bụ na o nyebeghị unu udo nʼakụkụ niile? Nʼihi na o nyela m mmeri nʼebe ndị iro m nọ. Ugbu a, ala a dịkwa nʼaka Onyenwe anyị na nʼaka ndị ya.
1CH 22:19 Ya mere, tinyenụ obi unu na mmụọ unu nʼịgbaso Onyenwe anyị Chineke unu. Malitekwanụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke, ka unu nweekwa ike ibubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na ihe nsọ ndị ọzọ nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a ga-ewu nʼihi Aha Onyenwe anyị.”
1CH 23:1 Mgbe Devid ghọrọ nnọọ agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ, o mere Solomọn nwa ya, eze Izrel.
1CH 23:2 Nʼoge a, ọ kpọkọtara ndị ndu Izrel niile, tinyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị.
1CH 23:3 A gụrụ ndị Livayị niile ọnụ, bụ ndị gbara iri afọ atọ gbagoo, chọpụta na ha dị iri puku ndị ikom atọ na asatọ nʼọnụọgụgụ.
1CH 23:4 Devid sịrị, “Nʼime ndị a, ka iri puku ndị ikom abụọ na anọ bụrụ ndị ga-ahụ maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, puku ndị ikom isii a bụrụ ndịisi na ndị ikpe,
1CH 23:5 puku ndị ikom anọ abụrụ ndị nche ọnụ ụzọ ama, ebe puku ndị ikom anọ ndị ọzọ ga-eji ihe egwu dị iche iche nke m kwadobere maka ito Onyenwe anyị, na-eto ya.”
1CH 23:6 Devid kewara ndị Livayị nʼoke, nʼoke dịka ụmụ ndị ikom Livayị si dị: Geshọn, Kohat na Merari.
1CH 23:7 E kekwara ikwu Geshọn ụzọ abụọ dịka ụmụ ya si dị, Ladan na Shimei.
1CH 23:8 Ndị sitere nʼezinaụlọ Ladan dị ndị ikom atọ: Jehiel, onyeisi ha, Zetam na Juel.
1CH 23:9 Ụmụ Shimei bụ, Shelomot, Haziel na Haran, ha dị ndị ikom atọ. Ndị a niile bụ ndịisi ezinaụlọ nʼikwu Ladan.
1CH 23:10 Ụmụ Shimei bụ, Jahat, Ziza, Jeush na Beriya. Ha dị ndị ikom anọ.
1CH 23:11 Jahat bụ onye mbụ, Ziza onye nke abụọ. Ma Jeush na Beriya amụtaghị ọtụtụ ụmụ ndị ikom. Nʼihi ya, a gụnyekọtara ha dịka otu ezinaụlọ, kenye ha otu ọrụ.
1CH 23:12 Ụmụ ndị ikom Kohat bụ Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Ha dị ndị ikom anọ.
1CH 23:13 Ụmụ ndị ikom Amram bụ, Erọn na Mosis. Erọn ka e kewapụrụ iche, ido ya nsọ ya na ụmụ ya ruo ebighị ebi, maka ido ihe niile kachasị nsọ nsọ, ịchụ aja nʼihu Onyenwe anyị, ije ozi nʼihu ya nakwa ikwupụta ngọzị nʼaha ya ruo ebighị ebi.
1CH 23:14 Ụmụ Mosis, onye nke Chineke ka a gụnyekọtara dịka ndị si nʼebo Livayị.
1CH 23:15 Ụmụ ndị ikom Mosis bụ, Geshọm na Elieza.
1CH 23:16 Ụmụ ndị ikom Geshọm bụ Shubuel, onye mbụ.
1CH 23:17 Ụmụ ụmụ Elieza bụ Rehabaya onye mbụ. Elieza amụtaghị ụmụ ndị ikom ọzọ, ma ụmụ ndị ikom Rohabaya dị ọtụtụ.
1CH 23:18 Ụmụ ndị ikom Izha bụ Shelomit onye mbụ.
1CH 23:19 Ụmụ ndị ikom Hebrọn bụ Jereaya onye mbụ, na Amaraya, onye nke abụọ, Jahaziel onye nke atọ, na Jekameam, onye nke anọ.
1CH 23:20 Ụmụ ndị ikom Uziel bụ Maịka, onye mbụ, na Ishaya, onye nke abụọ.
1CH 23:21 Ụmụ ndị ikom Merari bụ Mahali na Mushi Ụmụ ndị ikom Mali bụ Elieza na Kish
1CH 23:22 Elieza nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ndị ikom. Ọ bụ naanị ụmụ ndị inyom ka ọ mụtara. Ụmụ nwanne nna ha, ụmụ ndị ikom Kish, lụrụ ha.
1CH 23:23 Ụmụ ndị ikom Mushi bụ Mahali, Eda na Jeremot. Ha dị ndị ikom atọ.
1CH 23:24 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị, ndịisi ezi, dịka e si debanye aha, na dịka e si gụọ ha ọnụ nʼotu nʼotu, ya bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị gbara iri afọ abụọ gbagoo.
1CH 23:25 Nʼihi na Devid kwuru sị, “Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị, Chineke Izrel enyela ndị ya udo, ebe ọ bụkwa na ọ ga-ebi na Jerusalem ruo ebighị ebi.
1CH 23:26 Ugbu a, ọ dịkwaghị mkpa ọ dị na ndị Livayị ga na-ebugharị ụlọ ikwu, maọbụ ngwongwo ọbụla nke ije ozi niile ya.”
1CH 23:27 Ịgụ ndị Livayị ọnụ bụ otu nʼime ihe ikpeazụ Devid mere tupu ọ nwụọ. A gụrụ ndị Livayị gbara iri afọ abụọ gbagoo ọnụ.
1CH 23:28 Ọrụ e nyere ndị Livayị niile bụ inyere ụmụ Erọn ndị nchụaja aka nʼofufe nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị: ilekọta ogige, na ọnụụlọ nta ndị dị nʼakụkụ ya niile, na ime ka ihe nsọ niile dị ọcha, na ịrụ ọrụ ọbụla e nyere ha nʼụlọ Chineke.
1CH 23:29 Ọ bụkwa ọrụ ha iwebata achịcha a na-eche nʼihu Chineke, na ụtụ ọka e ji enye onyinye mkpụrụ ọka, na achịcha mbadamba a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. Ọrụ ha bụkwa ịgwakọta ihe e ji eme achịcha, na ighe ya, na ilekọta ihe ọtụtụ niile e ji atụ ihe.
1CH 23:30 Ụtụtụ ọbụla, na anyasị ọbụla, ọ bụ ọrụ ha iguzo nʼihu Onyenwe anyị ịbụ abụ otuto, na ekele.
1CH 23:31 Ha na-enyekwa aka nʼihe gbasara aja nsure ọkụ a na-achụ nʼụbọchị izuike, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka. Mgbe niile ka ha ga-eje ozi ha nʼihu Onyenwe anyị dịka usoro ha na ọnụọgụgụ ha si dị.
1CH 23:32 Ya mere, e tinyere ọrụ ilekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị, na ụlọnsọ ukwu ahụ nʼaka ha. Ha ka ọ dịkwara inyere ndị ikwu ha, bụ ndị nchụaja ahụ, ụmụ Erọn, aka nʼọrụ ha niile nʼụlọnsọ ukwu ahụ.
1CH 24:1 Ndị a bụ otu e si kenye ụmụ Erọn ọrụ ije ozi ha: Ụmụ ndị ikom Erọn bụ Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.
1CH 24:2 Ma Nadab na Abihu nwụrụ tupu nna ha anwụọ. Ha amụtaghị ụmụ ndị ikom, ya mere, Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja.
1CH 24:3 Devid kewara ha dịka usoro ije ozi ha ga-esi dị. Ọ bụ Zadọk onye ikwu Elieza, na Ahimelek onye ikwu Itama nyeere Devid aka ime nke a.
1CH 24:4 Ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Elieza karịrị ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Itama. Nʼihi ya, e sitere nʼikwu Elieza nweta ndịisi ezinaụlọ iri na isii, sitekwa nʼikwu Itama nweta ndịisi ezinaụlọ asatọ.
1CH 24:5 E kere ha na-eleghị onye ọbụla anya nʼihu, site nʼife nza, nʼihi na e nwere ndịisi ozi ebe nsọ, nweekwa ndịisi ozi Chineke nʼetiti ndị ikwu Elieza na Itama.
1CH 24:6 Ode akwụkwọ Shemaya, nwa Netanel, onye Livayị, dekọtara aha ndị a niile nʼihu eze, na ndịisi ozi eze, ya bụ, Zadọk onye nchụaja, na Ahimelek nwa Abịata, na ndịisi ezi ndị nchụaja, na nke ndị Livayị. E sitere nʼikwu Elieza, họrọ otu ezinaụlọ, sitekwa nʼikwu Itama họrọ otu ezinaụlọ.
1CH 24:7 Nza nke mbụ mara Jehoiarib nke abụọ a maa Jedaya
1CH 24:8 nke atọ, Harim nke anọ, Seorim
1CH 24:9 nke ise, Malkija nke isii, Mijamin
1CH 24:10 nke asaa, Hakoz nke asatọ, Abija
1CH 24:11 nke itoolu, Jeshua nke iri, Shekanaya
1CH 24:12 nke iri na otu, Eliashib nke iri na abụọ, Jakim
1CH 24:13 nke iri na atọ, Hupa nke iri na anọ, Jeshebeab
1CH 24:14 nke iri na ise, Bilga nke iri na isii, Imea
1CH 24:15 nke iri na asaa, Hezia nke iri na asatọ, Hapizez
1CH 24:16 nke iri na itoolu, Petahaya nke iri abụọ, Jehezkel
1CH 24:17 nke iri abụọ na otu, Jakin nke iri abụọ na abụọ, Gamul
1CH 24:18 nke iri abụọ na atọ, Delaya nke iri abụọ na anọ, Maazaya.
1CH 24:19 Otu a ka e si keere ha usoro ije ozi ha mgbe ha batara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. E mere ya dị ka ụkpụrụ nna nna ha Erọn nyere ha si dị, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya nʼiwu.
1CH 24:20 Ndị a bụkwa ndị ndu a họpụtara nʼebo Livayị: Site nʼụmụ Amram, a họpụtara Shubuel. Site nʼụmụ Shubuel a họpụtara Jehdeia.
1CH 24:21 Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya.
1CH 24:22 Site na ndị Izha a họpụtara Shelomot. Sitekwa nʼụmụ Shelomot a họpụtaara Jahat.
1CH 24:23 Site nʼụmụ Hebrọn a họpụtara Jeraya, nwa mbụ ya, Amaraya nwa nke abụọ ya, Jahaziel nwa nke atọ ya na Jekameam nwa nke anọ ya.
1CH 24:24 A họpụtara Maịka nwa Uziel, sitekwa nʼụmụ Maịka họpụta Shamia.
1CH 24:25 A họpụtara nwanne Maịka nke nwoke aha ya bụ Ishaya, sitekwa nʼụmụ Ishaya họpụta Zekaraya.
1CH 24:26 Site nʼụmụ Merari e nwere Mahali na Mushi. A họpụtakwara Beno nwa Jaazia.
1CH 24:27 Sitekwa nʼụmụ Merari a họpụtara ụmụ Jaazia ndị a: Beno, Shoham, Zakua na Ibri.
1CH 24:28 Site nʼụmụ Mahali a họpụtara Elieza, ma Elieza nʼonwe ya amụtaghị nwa nwoke.
1CH 24:29 Site nʼụmụ Kish a họpụtara Jerameel.
1CH 24:30 Site nʼụmụ Mushi, a họpụtara Mahali, na Eda na Jerimot. Ndị a niile bụ ndị Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị.
1CH 24:31 Dịka e mere mgbe a na-ahọpụta ụmụ Erọn, e ji ife nza kenye ha niile ọrụ ha kwesiri ịrụ nʼotu nʼotu, onye ukwu ha na onye nta ha. E mere ya nʼihu eze Devid, na Zadọk, na Ahimelek, na ndịisi ezinaụlọ ndị nchụaja na ndị Livayị niile. Mgbe a na-efe nza a, e mesoro ndị ikom niile otu mmeso, ma okenye ha ma ndị na-etolite etolite.
1CH 25:1 Devid na ndịisi agha ndị Izrel họpụtara ndị ga na-ebu amụma mgbe ndị ji ụbọ akwara, une na ogene na-eti egwu. Ha sitere nʼụmụ Asaf, Heman na Jedutun, họpụta ha. Ndị a bụ aha ndị rụrụ ọrụ nke a:
1CH 25:2 Ndị amụma na-ebu amụma, ndị nke bụ ụmụ Asaf: Zakua, Josef, Netanaya na Asarela bụ ụmụ Asaf nọ nʼokpuru Asaf, onye nọ nʼokpuru eze bụ onyeisi ha.
1CH 25:3 Ma nye Jedutun, ụmụ ndị ikom ya: Gedaliya, Zeri, Jeshaya, Shimei, Hashabaya na Matitaia. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ nọrọ nʼokpuru nna ha bụ Jedutun, onye na-ebu amụma, na-eji une na-enye Onyenwe anyị ekele na otuto.
1CH 25:4 Ma nye Heman, ụmụ ndị ikom ya: Bukaya, Matanaya, Uziel, Shubuel, Jerimot, Hananaya, Hanani, Eliata, Gidalti, Romamti-Eza, Joshbekasha, Maloti, Hotia, na Mahaziot.
1CH 25:5 Ndị a niile bụ ụmụ Heman, onye bụ ọhụ ụzọ eze. Dịka nkwa Chineke kwere maka ibuli ya elu, Chineke nyere ya ụmụ ndị ikom iri na anọ, na ụmụ ndị inyom atọ.
1CH 25:6 Ụmụ ndị ikom ndị a niile nọ nʼokpuru nna ha, maka ịbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị na-eji ịkpọ ụbọ na une na iti ọla na-ada ụda, nʼihi ofufe ụlọ Chineke. Asaf, na Jedutun, na Heman nọkwa nʼokpuru nlekọta eze.
1CH 25:7 Ọnụọgụgụ ha tinyere ụmụ nne ha ndị e nyere ọzụzụ nʼihe gbasara abụ, bụ ndị nwere nghọta nʼihe banyere abụ a na-abụku Onyenwe anyị, dị narị abụọ, na iri asatọ na asatọ (288).
1CH 25:8 Ha ji ife nza kee ọrụ ha, ma onye ukwu ma onye nta nʼime ha, ndị nwere nghọta ma ndị a na-azụ azụ, nʼotu aka ahụ.
1CH 25:9 Nza nke mbụ e fere mara Josef nwa Asaf, ya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12). Nke abụọ, Gedaliya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:10 Nke atọ, Zakua na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:11 Nke anọ, Izri na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:12 Nke ise, Netanaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:13 Nza nke isii mara Bukaya, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:14 Nke asaa, Jesarela na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:15 Nke asatọ, Jeshaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:16 Nke itoolu, Matanaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:17 Nke iri, Shimei na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:18 Nke iri na otu, Azarel na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:19 Nza nke iri na abụọ mara Hashabaya, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:20 Nke iri na atọ, Shubuel na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:21 Nke iri na anọ, Matitaia na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:22 Nke iri na ise, Jeremot na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:23 Nke iri na isii, Hananaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:24 Nke iri na asaa, Joshbekasha na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:25 Nza nke iri na asatọ mara Hanani, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:26 Nke iri na itoolu, Maloti na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:27 Nke iri abụọ, Eliata na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:28 Nke iri abụọ na otu, Hotia na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:29 Nke iri abụọ na abụọ, Gidalti na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:30 Nke iri abụọ na atọ, Mahaziot na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 25:31 Ebe nza nke iri abụọ na anọ mara Romamti-Eza, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
1CH 26:1 Usoro otu ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Site na ndị Kora: Meshelemaia, nwa Kore, otu nʼime ụmụ Asaf.
1CH 26:2 Meshelemaia nwekwara ụmụ ndị ikom: nke mbụ bụ Zekaraya, na Jediael nke abụọ, Zebadaya, bụ nke atọ, Jatniel, nke anọ
1CH 26:3 Elam, nke ise na Jehohanan, bụ nke isii na Eliehoenai bụ onye nke asaa.
1CH 26:4 Obed-Edọm nwekwara ụmụ ndị ikom. Ha bụ ndị a: Shemaya, nwa mbụ ya, Jehozabad, osote ya, Joa, nke atọ, Saka, bụ onye nke anọ Netanel, nke ise,
1CH 26:5 Amiel, nke isii Isaka, nke asaa na Peuletai, onye bụ onye nke asatọ. Nʼihi na Chineke gọziri Obed-Edọm.
1CH 26:6 Shemaya, nwa ya mụtakwara ụmụ ndị ikom, ndị bụ ndị ndu nʼezinaụlọ nna ha, nʼihi na ha bụ dike na dimkpa.
1CH 26:7 Ụmụ ndị ikom Shemaya bụ, Otni, Refael, Obed na Elzabad; ụmụnne ya bụ Elihu na Semakaya bụkwa dike na dimkpa.
1CH 26:8 Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm; ha na ụmụ ha ndị ikom, na ndị ikwu ha niile bụ dimkpa ndị nwere ike ịrụ ọrụ ahụ. Ha niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm. Ha dị iri isii na abụọ (62) nʼọnụọgụgụ.
1CH 26:9 E sitekwara nʼezinaụlọ Meshelemaia họpụta ndịisi iri na asatọ (18) ndị bụkwa ezi ndị ndu.
1CH 26:10 Hosa, nwa Merari nwekwara ụmụ ndị ikom: Shimri onye nke mbụ (ọ bụ ezie na ọ bụghị ọkpara ya ma nna ya họpụtara ya ka ọ bụrụ onye mbụ).
1CH 26:11 Hilkaya, nke abụọ, Tebalaya, nke atọ na Zekaraya onye nke anọ. Ụmụ ndị ikom na ụmụnne Hosa nwere dị iri na atọ (13).
1CH 26:12 E kere ndị nche ụlọnsọ ukwu niile nʼotu nʼotu. Otu ndị a nwekwara ndịisi. E kenyekwara otu ọbụla ọrụ dịka e si kenye ụmụnna ha ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
1CH 26:13 E sitere nʼife nza kenye ma nwantakịrị ma okenye, ọnụ ụzọ ha ga-eche nche, dịka ezinaụlọ ha si dị.
1CH 26:14 Site nʼife nza, Shelemaya ketara iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nche. Zekaraya nwa ya, onye ndụmọdụ nwere uche, sitekwara nʼife nza keta iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ugwu, ya na ndị otu ya.
1CH 26:15 Obed-Edọm na ndị otu ya na-eche ụzọ dị na ndịda. Ụmụ ya bụ ndị na-eche ụlọ ebe a na-achịkọta ihe.
1CH 26:16 Shupim na Hosa na-eche ọnụ ụzọ dị nʼọdịda anyanwụ ya na ọnụ ụzọ ama Shaleket nke dị nʼụzọ elu elu. Ndị nche na-esota ndị nche ibe ha.
1CH 26:17 Ya mere, ọ bụ ndị Livayị isii na-eche nche nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ụbọchị niile. Mmadụ anọ na-anọ nʼugwu, anọ na ndịda, abụọ nʼebe a na-achịkọbata ihe.
1CH 26:18 Nʼogige nke dị nʼọdịda anyanwụ e nwere ndị nche anọ nʼụzọ, ndị nche abụọ ọzọ nʼime ogige nʼonwe ya.
1CH 26:19 A họpụtara ndị nche ndị a site nʼikwu Kora na Merari.
1CH 26:20 Ụfọdụ ndị Livayị ka e nyefere ọrụ ilekọta ụlọakụ, na ụlọ a na-echekọta onyinye niile e doro nsọ nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu Chineke.
1CH 26:21 Ndị agbụrụ Ladan, ndị si nʼikwu Geshọn, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ nna ha Ladan, bụ onye Geshọn, bụ Jehieli,
1CH 26:22 na ụmụ ndị ikom Jehieli, Zetam na nwanne ya nwoke Juel. Ndị a bụ ndị na-elekọta ụlọakụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
1CH 26:23 Site na ndị Amram, na ndị Izha, na ndị Hebrọn, na ndị Uziel.
1CH 26:24 Shubuel nwa Geshọm, na nwa nwa Mosis ka e nyere ọrụ ịbụ onyeisi ụlọakụ dị nʼụlọnsọ ahụ.
1CH 26:25 Ụmụnna ya site na Elieza bụ ndị a, Rehabaya nwa ya nwoke, Jeshaya nwa nwoke Rehabaya, Joram nwa nwoke Jeshaya na Zikri nwa nwoke Shelomit.
1CH 26:26 Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị nʼaka ilekọta ụlọakụ nke ihe nsọ niile, nke Devid bụ eze, na ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi agha ndị ọzọ, doro nsọ.
1CH 26:27 Ụfọdụ ihe agha na ihe sitere nʼihe a kwatara nʼagha ka ha doro nsọ maka idozi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
1CH 26:28 Ya na ihe niile nke Samuel, bụ onye ọhụ ụzọ, na Sọl, nwa Kish na Abna, nwa Nea na Joab, nwa Zeruaya na ihe niile ndị ọzọ e doro nsọ. Ọ bụ nʼaka Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị ilekọta ha.
1CH 26:29 Site nʼikwu Izha, Kenaniya, na ụmụ ndị ikom ya ka ozi dịrị pụọ nʼụlọnsọ, dịka ndịisi na ndị ikpe nye ndị Izrel.
1CH 26:30 Site na ndị Hebrọn, Hashabaya na ụmụnna ya ndị bụkwa dimkpa, ọnụọgụgụ ha dị otu puku na narị asaa, ka e mere ndịisi ala Izrel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Ihe niile banyere ọrụ Onyenwe anyị, na ijere eze ozi dị ha nʼaka.
1CH 26:31 Jeraya bụ onyendu ndị Hebrọn, dịka akwụkwọ e dekọrọ usoro ọmụmụ si gosi. Nʼihi na nʼafọ nke iri anọ nke ọchịchị eze Devid nʼIzrel, ka e mere nnyocha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ chọpụta na e nwere ndị dị ike ọrụ nʼetiti ndị Hebrọn. A chọpụtara ndị a nʼobodo Jeza nke dị na Gilead.
1CH 26:32 Jeraya nwere ndị ikwu ya, ndị bụ dimkpa, na ndị dị ike ọrụ, ọnụọgụgụ ha dị puku abụọ na narị asaa. Ndị a niile bụkwa ndị ndu ezinaụlọ dị iche iche. Ya mere, Devid, eze Izrel, mere ha ndịisi ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase. Ọrụ ha bụ ilekọta ihe banyere ofufe Chineke na ije ozi niile metụtara eze.
1CH 27:1 Nke a bụ usoro ndị Izrel, dịka ọnụọgụgụ ha si dị, ndịisi ezinaụlọ, na ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi ha, bụ ndị na-ejere eze ozi nʼihe niile gbasara nkewa e kewara ndị agha dịka ịrụ ọrụ ha si dị nʼọnwa nʼọnwa nʼime ọnwa niile nke afọ. Nkewa ọbụla nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị iri puku ndị agha abụọ na anọ (24,000).
1CH 27:2 Ndị a bụ aha ọchịagha na-achị ndị agha nʼọnwa ọbụla. Onyeisi nkewa nke mbụ, maka ọnwa nke mbụ bụ Jashobeam nwa Zabdiel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).
1CH 27:3 O si nʼikwu Perez nke dị nʼebo Juda, ọ bụ onyeisi ndịisi agha nke ọnwa mbụ.
1CH 27:4 Onyeisi nkewa nke abụọ, maka ọnwa nke abụọ bụ Dodayi, nwa Ahohi bụ onyeisi agha nkewa nke abụọ. Miklot bụ onyendu otu a, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa a bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).
1CH 27:5 Onyeisi nkewa nke atọ, maka ọnwa nke atọ bụ Benaya nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ọ bụ onyeisi, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).
1CH 27:6 Nke a bụ Benaya ahụ bụ dike nʼagha nʼetiti iri ndịisi agha atọ, ma bụrụkwa onye na-achị iri ndị agha atọ ahụ. Amizabad nwa ya ka e tinyere ilekọta nkewa nke atọ a.
1CH 27:7 Onyeisi nkewa nke anọ, maka ọnwa nke anọ bụ Asahel, nwanne Joab. Zebadaya nwa bụ onye nnọchiri anya ya. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). Zebadaya nwa ya, nọchiri anya ya mgbe ọ nwụrụ.
1CH 27:8 Onyeisi nkewa nke ise, maka ọnwa nke ise bụ Shamhut onye Izha. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).
1CH 27:9 Onyeisi nkewa nke isii, maka ọnwa nke isii bụ Ira nwa Ikesh, onye Tekoa, bụ onyeisi agha nkewa nke isii. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).
1CH 27:10 Onyeisi nkewa nke asaa, maka ọnwa nke asaa bụ Helez onye Pelon. Onye sitere nʼikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).
1CH 27:11 Onyeisi nkewa nke asatọ, maka ọnwa nke asatọ bụ Sibekai onye Husha. Onye sitere nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).
1CH 27:12 Onyeisi nkewa nke itoolu, maka ọnwa nke itoolu bụ Abieza onye Anatot. Onye sitere nʼikwu Benjamin. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).
1CH 27:13 Onyeisi nkewa nke iri, maka ọnwa nke iri bụ Maharai onye Netofa, site nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).
1CH 27:14 Onyeisi nkewa nke iri na otu, maka ọnwa nke iri na otu bụ Benaya onye Piraton, nke ikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).
1CH 27:15 Onyeisi nkewa nke iri na abụọ, maka ọnwa nke iri na abụọ bụ Heldai onye Netofa. Onye sitere nʼezinaụlọ Otniel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).
1CH 27:16 Ndị a bụ ndị ndu ebo Izrel niile: Elieza nwa Zikri bụ onyendu ndị Ruben; Shefataya nwa Maaka bụ onyendu ndị Simiọn;
1CH 27:17 Hashabaya nwa Kemuel bụ onyendu ndị Livayị; Zadọk bụ onyendu ụmụ Erọn;
1CH 27:18 Elihu nwanne Devid bụ onyendu ndị Juda; Omri nwa Maikel bụ onyendu ndị Isaka;
1CH 27:19 Ishmaya nwa Ọbadaya bụ onyendu ndị Zebụlọn; Jerimot nwa Azriel bụ onyendu ndị Naftalị;
1CH 27:20 Hoshea nwa Azazaya bụ onyendu ndị Ifrem; Juel nwa Pedaya bụ onyendu ọkara ebo Manase;
1CH 27:21 Ido nwa Zekaraya bụ onyendu ọkara ebo Manase nke ọzọ dị na Gilead; Jaasiel nwa Abna bụ onyendu ndị Benjamin;
1CH 27:22 Azarel nwa Jeroham bụ onyendu ndị Dan. Ndị a niile bụ ndị ndu ebo Izrel niile.
1CH 27:23 Mgbe Devid gụrụ ụmụ Izrel ọnụ. Ọ gụghị ndị gbara site nʼiri afọ abụọ gbadaa ala, nʼihi na Onyenwe anyị kwere nkwa ime ka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel baa ụba dịka kpakpando eluigwe.
1CH 27:24 Joab nwa Zeruaya, agụchaghị mmadụ niile ọnụ nʼihi na Chineke tara Izrel ahụhụ nʼihi ịgụ ọnụ a. Ya mere, e denyeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole a gụtara nʼakwụkwọ akụkọ Devid eze Izrel nwere.
1CH 27:25 Azmavet nwa Adiel, bụ onye na-elekọta ụlọ ịchịkọta ihe eze. Ma Jonatan nwa Ụzaya bụ onyeisi ndị na-ahụ maka ụlọ nchịkọta ihe dị nʼakụkụ ala ahụ niile, ma nʼobodo ukwu, ma nʼobodo nta, ma nʼụlọ nche ndị Izrel niile.
1CH 27:26 Ezri nwa Kelub bụ onye na-elekọta ubi eze na ndị na-arụ ọrụ nʼime ya.
1CH 27:27 Shimei onye Ramat na-elekọta ubi vaịnị niile. Otu a kwa, Zabdi onye Sifma ka ọ dị nʼaka imepụta mmanya na ichekwa ha.
1CH 27:28 Baal-Hanan onye Gedera na-elekọta ubi oliv na osisi sikamọ eze, nke dị nʼoke ala ndị Filistia na Izrel. Joash ka ọ dị nʼaka iweta mmanụ oliv.
1CH 27:29 Shitrai onye Sharọn na-elekọta igwe ehi eze ndị na-ata nri na Sharọn. Shafat nwa Adlai na-elekọta igwe ehi ndị nke dị nʼala ndagwurugwu.
1CH 27:30 Obil onye Ishmel nwe ilekọta ịnyịnya kamel eze. Jehdeia onye Meronot na-elekọta ịnyịnya ibu.
1CH 27:31 Jaziz onye Haga bụ onyeisi na-elekọta igwe atụrụ. Ndị a niile bụ ndịisi na-elekọta akụ niile nke eze Devid nwere.
1CH 27:32 Jonatan nwanne nna Devid bụ onye ndụmọdụ na nwoke nwere ezi nghọta. Ọ bụkwa ode akwụkwọ. Jehiel nwa Hakmoni bụ onye na-elekọta ụmụ eze ndị ikom.
1CH 27:33 Ahitofel bụ onye na-adụ eze ọdụ. Hushaị onye Akai bụ enyi eze.
1CH 27:34 Mgbe Ahitofel nwụrụ, Jehoiada nwa Benaya na Abịata nọchiri anya ya. Joab bụ ọchịagha igwe ndị agha eze.
1CH 28:1 Devid kpọkọtara ndịisi ozi niile nke Izrel, ka ha zukọọ na Jerusalem, bụ ndị ndu ebo Izrel niile, na ndị ọchịagha nke otu ndị agha nọ nʼọrụ eze. Ndị ọzọ bụ ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi na-elekọta ihe niile na anụ ụlọ niile nke eze na ụmụ ya ndị ikom nwere, tinyere ndị ozi niile nọ nʼụlọeze, na ndị bụ dimkpa na ndị niile bụ dike nʼagha.
1CH 28:2 Eze Devid biliri kwụrụ ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ụmụnna m, na ndị m. Ọ bụrịị ihe dị m nʼobi iwu ụlọ nke ga-abụ ebe izuike nye igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, nke ga-abụ ebe mgbakwasị ụkwụ nye Chineke anyị. Edokọtachaala m ihe e ji ewu ya,
1CH 28:3 ma Chineke sịrị m, ‘Ọ bụghị gị ga-ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị bụ onye na-ebu agha, onye wufuru ọbara site nʼigbu ọtụtụ mmadụ nʼagha.’
1CH 28:4 “Ma otu ọ dị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel esitela nʼetiti ikwu m họpụta m, mee m eze Izrel ruo ebighị ebi. Ọ họọrọ ebo Juda dịka onyendu. Ọ bụkwa site nʼebo Juda ka o si họrọ ụlọ nna m, sitekwa nʼetiti ụmụnne m ndị ikom họrọ m. Mee m eze Izrel.
1CH 28:5 Onyenwe anyị enyela m ọtụtụ ụmụ ndị ikom, ma site nʼime ha ọ họpụtara Solomọn nwa m ka ọ nọkwasị nʼocheeze nke alaeze Onyenwe anyị dịka eze Izrel.
1CH 28:6 Ọ gwara m, ‘Solomọn nwa gị, bụ onye ga-ewuru m ụlọ m, na ogige m niile, nʼihi na ahọpụtala m ya ị bụrụ m nwa, aga m abụkwara ya nna.
1CH 28:7 Ọ bụrụkwa na o debe ihe niile m nyere nʼiwu, mezuo ha dịka o si eme nʼoge a. Aga m eme ka alaeze ya dịgide ruo ebighị ebi.’
1CH 28:8 “Ya mere, ugbu a ana m enye unu iwu nʼihu ndị Izrel niile, na nʼihu ọgbakọ ndị nke Onyenwe anyị, na nʼihu Chineke anyị. Kpachapụnụ anya chọpụta ma debekwa iwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu, ka unu nwee ike nweta ezi ala nke a; ma nyefeekwa ya dịka ihe nketa nʼaka ụmụ ụmụ unu ruo ebighị ebi.
1CH 28:9 “Ma gị, Solomọn nwa m, mara Chineke nke nna gị, jiri obi zuruoke, na mmụọ nwere njikere mgbe niile fee Onyenwe anyị ofufe, nʼihi na Onyenwe anyị na-enyocha obi mmadụ niile. Ọ na-aghọtakwa ihe niile anyị bu nʼobi na echiche niile. Ọ bụrụ na ị chọsie ụzọ ya ike, ị ga-achọta ya, ma ọ bụrụ na ị jụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo ebighị ebi.
1CH 28:10 Kpachapụ anya, nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla gị iwuru ya ụlọnsọ ya. Dị ike, rụọkwa ọrụ a e tinyere gị nʼaka.”
1CH 28:11 Mgbe ahụ, Devid nyere Solomọn nwa ya ihe e sere gbasara otu ọ ga-esi wuo ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, na nke ụlọ ndị ọzọ niile ga-adị nʼime ya, na nʼakụkụ ya; ụlọakụ ya niile, na ime ụlọ elu ya, na ime ụlọ ya, na ụlọ ebe ikpuchi mmehie.
1CH 28:12 O nyekwara ya ihe osise gosiri ihe niile nke Mmụọ Nsọ tinyere ya nʼuche banyere ogige ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị ahụ, na ọnụụlọ niile dị ya gburugburu, maka ụlọ nchịkọta akụ nke ụlọnsọ Chineke nakwa akụ niile nke e doro nsọ.
1CH 28:13 Devid nyekwara Solomọn iwu otu ọ ga-esi kewaa ndị nchụaja na ndị Livayị, na iwu metụtara ọrụ ije ozi niile nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na iwu metụtara ngwongwo niile e ji eje ozi.
1CH 28:14 Ọ wepụtara ọlaedo dị ukwuu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaedo a ga-eji jee ozi dị iche iche. Ọ wepụtakwara ọlaọcha dị ukwu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaọcha a ga-eji jee ozi dị iche iche.
1CH 28:15 Ọ wepụtara ọlaedo nke e ji akpụ iheọkụ na ihe ịdọba iheọkụ. Wepụtakwa ọlaọcha ga-ezu ịkpụ oriọna ọlaọcha, na ihe ịdọba ha.
1CH 28:16 Ọ wepụtara ọlaedo e ji akpụ tebul achịcha nsọ, na ọlaedo e ji akpụ tebul ndị ọzọ, na ọlaọcha e ji akpụ tebul ọlaọcha.
1CH 28:17 Ọ wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ndụdụ e ji adụrụ anụ e ji chụọ aja, efere ịkwọsa mmiri na ite mmiri; ọlaedo zuru nke e ji akpụta efere ọlaedo ọbụla, na ọlaọcha zuru nke e ji akpụta efere ọlaọcha ọbụla, wepụtakwa ọlaọcha na ọlaedo.
1CH 28:18 Nʼikpeazụ, o wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. O nyere ya ihe osise gosiri otu a ga-esi wuo ụgbọ agha, ya bụ, mmụọ ozi cherubim ndị ahụ e ji ọlaedo kpụọ, ndị gbasapụrụ nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
1CH 28:19 Devid kwuru sị, “E deela ihe niile gbasara osise ụlọnsọ ukwu a nʼakwụkwọ nke m sitere na ntụziaka Onyenwe anyị nweta. Onyenwe anyị nyekwara m nghọta banyere ihe niile metụtara osise ụlọnsọ ukwu a.”
1CH 28:20 Devid gwakwara nwa ya Solomọn okwu sị, “Dị ike, nwee obi ike, rụọ ọrụ a. Atụla ụjọ, adakwala mba, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, bụ Chineke m, nọnyeere gị. Ọ gaghị ahapụ gị, maọbụ gbakụta gị azụ. Ọ ga-ahụ na ihe niile gaara gị nke ọma, tutu ruo mgbe ọrụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị gwụsịrị.
1CH 28:21 Ndị nchụaja ndị a niile, na ndị Livayị jikeere ịrụ ọrụ niile metụtara ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ. Ndị ọzọ bụ ndị ọka ọrụ dị iche iche ndị o metụrụ nʼobi ga-abịakwa inyere gị aka, ma ndị ozi, ma ndị Izrel niile; ha ga-emezu iwu ọbụla i nyere ha.”
1CH 29:1 Mgbe ahụ, Devid gwara ọgbakọ Izrel niile okwu sị ha, “Nwa m Solomọn, onye Chineke họpụtara ịbụ eze nʼọnọdụ m, bụ nwantakịrị na-amachabeghị ihe. Ma ọrụ o nwere ịrụ dị ukwuu, nʼihi na ụlọ ukwu a abụghị mmadụ ka ọ dịrị, kama ọ bụ nye Onyenwe anyị Chineke.
1CH 29:2 Ma nʼike m niile, agbalịala m wetachaa ihe niile a ga-eji wuo ụlọnsọ ukwu Chineke m ebe ha dị ukwuu: ọlaedo a ga-eji kpụọ ihe ọlaedo niile, ọlaọcha a ga-eji kpụọ ihe ọlaọcha niile, bronz a ga-eji kpụọ ihe bronz niile, igwe a ga-eji kpụọ ihe igwe niile, na osisi a ga-eji rụọ ihe osisi niile, nkume dị oke ọnụahịa ọniks, a ga-ahịọnye ahịọnye, na nkume dị oke ọnụahịa tọkwọisi, na nkume ndị ọzọ ụcha ha dị iche iche, na nkume ndị ọzọ mara mma, tinyere mabụl.
1CH 29:3 Ugbu a, nʼihi mmasị m nʼebe ụlọnsọ Chineke m dị, ana m enye akụ nke aka m niile, ya bụ ọlaedo na ọlaọcha m, iji ya nye aka, maka iwu ụlọnsọ ukwu Chineke m. Ihe ndị a ka m na-enye, tụkwasịkwa nʼelu ihe ndị ọzọ niile bụ nke m nyerela, nʼihi ụlọnsọ ukwu a:
1CH 29:4 bụ puku talenti ọlaedo atọ (ọlaedo e si Ọfịa bubata), na puku talenti ọlaọcha asaa nke a nụchara anụcha, nke a ga-eji machite ahụ ụlọ niile nke ụlọ ndị ahụ.
1CH 29:5 Maka ọrụ niile a ga-eji ọlaedo rụọ, na nke a ga-eji ọlaọcha rụọ, na ọrụ niile ndị ǹka ga-arụ. Ugbu a, onye jikeere iwere onwe ya nyechasịa Onyenwe anyị nʼaka taa?”
1CH 29:6 Mgbe ahụ, ndịisi ezinaụlọ, na ndịisi ozi nke ebo Izrel niile, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi na-elekọta ọrụ eze, jiri obi ha niile nye onyinye.
1CH 29:7 Ha nyere maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke. Ha nyere puku talenti ọlaedo ise, na puku darik ọlaedo iri, nyekwa puku talenti ọlaọcha iri, na puku talenti bronz iri na asatọ, na narị puku talenti igwe.
1CH 29:8 Ndị niile nwere nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche webatara ya tinye ha nʼụlọakụ dị nʼụlọ nso ukwu Onyenwe anyị, nke Jehiel onye Geshọn na-elekọta.
1CH 29:9 Ndị Izrel niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi otu ndịisi ha jiri wepụta obi nye onyinye, nʼihi na ha ji ọṅụ na obi ha niile nye Onyenwe anyị onyinye. Eze Devid nʼonwe ya ṅụrịkwara ọṅụ nke ukwuu.
1CH 29:10 Nʼihu ọha Izrel niile, Devid kelere Onyenwe anyị ekele sị, “Otuto dịrị gị Onyenwe anyị Chineke nna anyị Izrel site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
1CH 29:11 Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe ịdị ukwu, na ike, na ịma mma, na ugwu eze, na ebube, nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị. Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe alaeze. Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile.
1CH 29:12 Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa. Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile. Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike.
1CH 29:13 Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-enye gị ekele na-etokwa aha gị dị ebube.
1CH 29:14 “Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị.
1CH 29:15 Anyị bụ ndị ọbịa na ndị mbịarambịa nʼihu gị, dịka nna nna anyị ha. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dị ka onyinyo, nke olileanya na-adịghị nʼime ya.
1CH 29:16 O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ihe niile ndị a anyị bukọrọ maka iji rụọra gị ụlọnsọ si nʼaka gị bịa. Ha niile bụkwa nke gị.
1CH 29:17 Amaara m, Chineke m, na ị na-anwale obi, na i na-enwekwa mmasị nʼihe ziri ezi. Ihe ndị niile ka m onwe m nyere site nʼafọ ofufu nakwa obi ziri ezi. Ma ugbu a, ahụla m ọṅụ ndị gị, bụ ndị nọ nʼebe a, ji were afọ ofufu nye gị onyinye ha.
1CH 29:18 Ya mere, gị Onyenwe anyị, Chineke nna anyị Ebraham na Aịzik, na Izrel, biko, mee ka ụdị ọchịchọ a dịgide nʼime obi ndị gị ruo ebighị ebi, meekwa ka ha jiri obi ha niile gbasoo gị mgbe niile.
1CH 29:19 Nye nwa m Solomọn obi zuruoke nke ọ ga-eji debe iwu gị niile, ọchịchọ gị niile na ụkpụrụ gị niile, ya na mmụọ imezu ihe niile metụtara owuwu ụlọnsọ ukwu a nke m kwadooro ihe niile ndị a.”
1CH 29:20 Mgbe ahụ, Devid gwara ndị Izrel okwu sị, “Toonu Onyenwe anyị Chineke unu!” Ha niile toro Onyenwe anyị Chineke nna ha, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị na eze.
1CH 29:21 Nʼechi ya, ha wetara otu puku oke ehi, na otu puku ebule, na otu puku ụmụ ebule jiri ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ. Tinyere aja ihe ọṅụṅụ na ọtụtụ aja ndị ọzọ nʼebe ọ bara ụba nʼihi ụmụ Izrel niile.
1CH 29:22 Emesịa, ha jiri ọṅụ rie oriri, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha nọkwa nʼebe ahụ nabata Solomọn, nwa Devid dịka eze nke ugboro abụọ, teekwa ya mmanụ nʼihu Onyenwe anyị ka ọ bụrụ onye ọchịchị. Ha mekwara Zadọk onye nchụaja.
1CH 29:23 Ya mere, Solomọn nọkwasịrị nʼocheeze Onyenwe anyị dịka eze, nʼọnọdụ nna ya Devid. Ọ bara ụba nke ukwuu. Ndị Izrel rubekwaara ya isi.
1CH 29:24 Ndịisi ọchịchị niile, na ndịisi Izrel niile, na ụmụ ndị ikom eze Devid niile kwupụtara nrube isi ha nye Solomọn, eze ọhụrụ.
1CH 29:25 Onyenwe anyị mere ka Solomọn dị ukwuu hie nne nʼanya ndị Izrel niile. Ọ yikwasịrị ya ebube nke alaeze nʼụdị ọ dịbeghị eze ọbụla buru ya ụzọ chịa nʼIzrel nweturula.
1CH 29:26 Devid nwa Jesi bụ eze ndị Izrel niile.
1CH 29:27 Ọ chịrị Izrel iri afọ anọ. Ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem.
1CH 29:28 Ọ nwụrụ mgbe ọ ghọrọ ezigbo agadi. Ọ bụkwa onye biri ogologo ndụ, onye nwekwara akụnụba na nsọpụrụ. Solomọn nwa ya nwoke nọchiri ya dịka eze.
1CH 29:29 Ihe niile gbasara ọchịchị eze Devid, site na mmalite rụọ nʼọgwụgwụ, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ Samuel, onye ọhụ ụzọ, na nʼakwụkwọ Netan, onye amụma, na nʼakwụkwọ Gad onye ọhụ ụzọ.
1CH 29:30 Akụkọ ndị a gosiri ihe gbasara ọchịchị eze ya, na ịdị ike ya, na ihe niile mere ya, na ihe mere ndị Izrel, na ndị eze ndị mba ọzọ bi ha gburugburu.
2CH 1:1 Solomọn nwa Devid mere onwe ya ka o guzosie ike nʼalaeze ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ya nọnyeere ya, meekwa ka ọ dị ukwuu hie nne.
2CH 1:2 Mgbe ahụ, Solomọn gwara ndị Izrel niile okwu, ya bụ, ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndị ikpe, na ndị ndu niile nọ nʼIzrel, na ndịisi ezinaụlọ niile.
2CH 1:3 Solomọn ya na ọgbakọ ahụ niile, gara nʼebe dị elu nke Gibiọn, nʼihi nʼebe ahụ ka ụlọ nzute Chineke dị, bụ nke Mosis onyeozi Onyenwe anyị wuru nʼọzara.
2CH 1:4 Ma Devid esitelarị na Kiriat Jearim buputa igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, bulaa ya nʼụlọ ikwu nke o wuru maka ya na Jerusalem.
2CH 1:5 Ebe ịchụ aja bronz ahụ Bezalel nwa Uri, nwa Hua wuru dịkwa na Gibiọn, nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị. Solomọn na ọgbakọ ahụ na-ajụta ya ase nʼebe bronz ahụ.
2CH 1:6 Solomọn jere nʼebe ịchụ aja ahụ e ji bronz kpụọ, nke dị nʼihu Onyenwe anyị, nʼime ụlọ nzute, jiri anụ ụlọ ọnụọgụgụ ha dị otu puku chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ya.
2CH 1:7 Nʼabalị ụbọchị ahụ na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya, sị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.”
2CH 1:8 Ma Solomọn zara Chineke, sị, “I gosila nna m bụ Devid obi ebere dị ukwuu. Ugbu a, i meekwala m eze nʼọnọdụ ya
2CH 1:9 Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke, ka nkwa gị nke i kwere nna m, bụ Devid, bụrụ ihe e mezuru, nʼihi na ị meela m eze ndị a bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja nke ala.
2CH 1:10 Biko, nye m amamihe na nghọta, nke m ga-eji edu ndị a napụ na-abata, nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?”
2CH 1:11 Chineke zara Solomọn sị ya, “Ebe ọ bụ na ị rịọghị m ka m nye gị akụnụba, maọbụ ogologo ndụ; ebe ọ bụkwa na ị rịọghị m ka m mee ka ndị kpọrọ gị asị nwụsịa, maọbụ ka m mee ka i nwee nsọpụrụ karịa, kama mkpa na-akpa gị bụ ka m nye gị amamihe na nghọta ị ga-eji duzie ndị m, nke m mere gị eze ha.
2CH 1:12 Ya mere, enyela gị amamihe na nghọta dịka ị rịọrọ. Aga m enyekwa gị akụnụba na nsọpụrụ dị ukwuu, nke eze ọbụla nke buru gị ụzọ na-enwebeghị. Ọ dịkwaghị onye nke ga-eso gị ga-enwe ụdị ya.”
2CH 1:13 Mgbe ahụ, Solomọn sitere nʼebe dị elu nke Gibiọn, site nʼihu ụlọ nzute ahụ, lọghachi na Jerusalem. Ọ chịrị dịka eze nʼIzrel.
2CH 1:14 Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ.
2CH 1:15 Eze mere ka ọlaọcha na ọlaedo baa ụba na Jerusalem, dịka nkume efu. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche
2CH 1:16 A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ.
2CH 1:17 Ha sitere nʼIjipt tụbata otu ụgbọ agha nʼọnụ ahịa narị shekel ọlaọcha isii; jirikwa otu narị shekel na iri shekel ise zụta otu ịnyịnya. Ha zipụkwara ha nye ndị eze niile nke ndị Het na ndị Aram.
2CH 2:1 Solomọn nyere iwu ka e wuo ụlọ nso ukwu nye Aha Onyenwe anyị, ka e wuokwara ya bụ Solomọn ụlọeze.
2CH 2:2 O manyere ndị ọrụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa (70,000) na-ebu ibu, na ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ (80,000), na ndị o doro dịka ndịisi ha, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị isii (3,600).
2CH 2:3 Solomọn zigara Hiram eze Taịa ozi sị ya, “Zidatara m osisi sida dịka i mere nʼoge nna m Devid wuru ụlọeze nke ya.
2CH 2:4 Ugbu a, ana m akwado iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, na ido ya nsọ nye ya maka ịchụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu ya, na idebe nʼebe ahụ achịcha nsọ a na-edo nʼusoro mgbe niile. Na isure aja nsure ọkụ ụtụtụ na anyasị, na nʼụbọchị izuike niile, na nʼọnwa ọhụrụ na nʼoge mmemme ndị ọzọ niile a kara aka nke Onyenwe anyị Chineke anyị. Nke a bụ ụkpụrụ na-adịgide nye ụmụ Izrel ruo ebighị ebi.
2CH 2:5 “Ụlọnsọ m ga-ewu ga-adị ukwuu nʼihi na Chineke anyị dị ukwuu karịa chi ndị ọzọ niile.
2CH 2:6 Ma onye pụrụ iwu ụlọnsọ nye ya, ebe ọ bụ na eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị? Onye ka mụ onwe m bụ, na m ga-ewu ụlọnsọ nye ya, ma ọ bụghị naanị ebe a ga-anọ chụọ aja dị iche iche nʼihu ya?
2CH 2:7 “Zitere m, onye ǹka, onye maara otu e si eji ọlaedo na ọlaọcha, na bronz, na igwe arụ ọrụ. Onye bụkwa onye maara ọrụ ǹka metụtara akwa dị iche iche, akwa ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie, na nke anụnụ anụnụ. Ọ ga-abụkwa onye igbunye akara nʼihe doro anya, onye ga-arụ ọrụ na Juda na nʼime Jerusalem, ebe ọ ga-eso ndị ǹka m, bụ ndị nna m Devid họpụtara rụọ ọrụ.
2CH 2:8 “Zitekwara m osisi sida, na osisi junipa, na osisi algụm, ndị sitere nʼọhịa Lebanọn, nʼihi na ndị gị bụ ọkachamara nʼọrụ ịwa osisi. Aga m ezitekwa ndị m ga-abịa soro ha rụọ ọrụ,
2CH 2:9 ime ka osisi ha ga-egbutere m dị ukwuu, nʼihi na ya bụ ụlọnsọ ga-ebu ibu, maakwa mma.
2CH 2:10 Aga m enye ndị ọrụ gị, bụ ndị na-awa osisi, narị puku bushel na iri puku bushel ọka wiiti abụọ a kwọrọ akwọ, na narị puku bushel na iri puku bushel ọka balị abụọ, na narị puku galọọnụ ite mmanya vaịnị na iri galọọnụ abụọ, nakwa narị puku galọọnụ mmanụ na iri galọọnụ mmanụ oliv abụọ.”
2CH 2:11 Hiram, eze Taịa zighachiiri Solomọn akwụkwọ ozi sị ya. “Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị hụrụ ndị ya nʼanya ka o ji mee gị eze ha.”
2CH 2:12 Hiram kwukwara sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye kere eluigwe na ụwa. Onye nyere Devid, bụ eze, nwa nwere nghọta na akọnuche dị otu a, iwuru Onyenwe anyị ebe obibi, na iwukwa ụlọeze nke aka ya.
2CH 2:13 “Ana m ezitere gị Huram-Abi, onye ọka maara ọrụ ya nke ọma.
2CH 2:14 Onye nne ya si nʼebo Dan nke dị nʼIzrel, ma nna ya bụ onye Taịa. Ọ bụ onye a zụrụ nʼọrụ ịkpụ ụzụ nke ọma, nʼihe gbasara ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, na nkume, na osisi. Ọ makwa otu e si eji akwa odo odo, na akwa anụnụ anụnụ, na akwa uhie uhie na ezi akwa ọcha arụ ọrụ. Igbunye ụdị akara ọbụla nʼihe nakwa ichepụta ihe ọ ga-eji ihe ọbụla enyere ya mee doro ya anya nke ọma. Ọ ga-esonye ndị ǹka gị, na ndị nke onyenwe m Devid, bụ nna gị.
2CH 2:15 “Ugbu a, ka onyenwe m zitere ndị ohu ya ọka wiiti ahụ, na ọka balị, na mmanya vaịnị, na mmanụ oliv, dịka ọ kwere na nkwa.
2CH 2:16 Anyị ga-egbutu osisi niile ị chọrọ site nʼugwu Lebanọn, sitekwa nʼosimiri budata ha obodo Jopa, ebe i nwere ike isite buruo ha Jerusalem.”
2CH 2:17 Emesịa, Solomọn gụrụ ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel ọnụ, dịka Devid mere, achọpụtara na ha dị narị puku iri ise na atọ, na narị isii (153,600).
2CH 2:18 O mere iri puku ndị ọrụ asaa (70,000) nʼime ha ka ha bụrụ ndị na-ebu ibu, na ọnụọgụgụ dị iri puku asatọ (80,000) ka ha bụrụ ndị ga-awa nkume, meekwa puku ndị ikom atọ na narị isii (3,600), ndị ga-abụ ndịisi ọrụ ime ka ọrụ na-aga nke ọma.
2CH 3:1 Mgbe ahụ, Solomọn malitere iwu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ọ bụ nʼugwu Mọrịa, nke dị na Jerusalem, ka e wukwasịrị ya, nʼebe ahụ Onyenwe anyị mere ka Devid bụ nna ya hụ ya anya. Ọ bụ nʼala ebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus, ebe ahụ Devid họpụtara.
2CH 3:2 O bidoro iwu ụlọ ahụ nʼabalị nke abụọ, nke ọnwa abụọ, nʼafọ nke anọ, nke ọchịchị eze ya.
2CH 3:3 Ntọala Solomọn tọrọ maka iwu ụlọnsọ Chineke dị iri mita abụọ na asaa nʼogologo, mita itoolu nʼobosara. (Nke a bụ ma ejiri ihe ọtụtụ ochie).
2CH 3:4 Ịdị ogologo mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ ukwu ahụ dị mita itoolu, dịka ịdị ogologo obosara ụlọ nso ahụ nʼonwe ya. Ịdị elu ya dịkwa mita itoolu. O jikwa ọlaedo a nụchara anụcha machie ime ya.
2CH 3:5 O ji osisi junipa machie ahụ ime ụlọ ezumezu ahụ, jirikwa ọlaedo a nụchara anụcha techie osisi ndị ahụ niile. Emesịa, e sere oyiyi nkwụ dị iche iche, na oyiyi ụdọ igwe nʼahụ ụlọ ahụ iji chọọ ya mma.
2CH 3:6 O ji nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche chọọ ime ụlọnsọ ahụ mma, ya na ọlaedo nke e si na Pavaim bute.
2CH 3:7 Ogidi osisi silin niile, na ibo ọnụ ụzọ niile, na aja ụlọ niile, na ọnụ ụzọ niile dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ ka o ji ọlaedo techie. Ọ gbukwara egbugbu oyiyi cherubim na mgbidi ya niile.
2CH 3:8 O wuru Ebe ahụ Kachasị Nsọ; nke ogologo ọnụ ụlọ ya dị mita iri, otu a kwa, obosara ya dị mita iri. O ji ọlaedo dị ezi mma nke ọnụahịa ya ruru narị talenti isii techie ahụ ime ụlọ ahụ niile.
2CH 3:9 Ịdị arọ ọlaedo e ji kpụọ ǹtu e ji wuo ya dị iri shekel ise. E jikwa ọlaedo techie akụkụ elu elu nke ime ọnụ ụlọ a.
2CH 3:10 Solomọn tinyere oyiyi mmụọ ozi cherubim abụọ ọ kpụrụ nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, werekwa ọlaedo machie ha.
2CH 3:11 Ịdị ogologo nku cherubim ndị a ruru mita iri. Ịdị ogologo otu nku cherub nke mbụ ruru mita abụọ na ọkara. Ọnụ nku a na-emetụ ahụ ime ụlọ nke ụlọnsọ ukwu, ma ọnụ ọnụ nku nke ọzọ, nke ịdị ogologo ya ruru mita abụọ nʼọkara, na-emetụ ọnụ otu nku cherub nke ọzọ.
2CH 3:12 Nʼotu aka ahụ, otu nku cherub nke abụọ ruru mita abụọ na ọkara nʼogologo. Ọnụ nku ya na-emetụ akụkụ nke ọzọ nke ahụ ime ụlọnsọ ukwu, ma nku ya nke ọzọ, nke rukwara mita abụọ na ọkara nʼogologo, na-emetụ ọnụ ọnụ otu nku cherub nke mbụ.
2CH 3:13 Nku cherubim ndị a gbasapụrụ ruo mita iri nʼogologo. Ha guzo ọtọ nʼụkwụ ha, na-eche ihu nʼọnụ ụlọ ezumezu ahụ.
2CH 3:14 O ji akwa na-acha anụnụ anụnụ, na uhie uhie, na odo odo, na ezi akwa ọcha, mee akwa mgbochi, nke a kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
2CH 3:15 O wuru ogidi abụọ dị nʼihu ụlọnsọ ahụ, nke ịdị elu ya ruru mita iri na asaa. Ọ kpụkwara ihe a dokwasịrị nʼelu ogidi ndị a, nke ịdị elu ha dị mita abụọ na ọkara.
2CH 3:16 Ọ kpụkwara ihe yiri ụdọ igwe a tụrụ atụ, nke e kokwasịrị nʼelu ogidi abụọ ndị ahụ. Kpụọkwa narị mkpụrụ pomegranet, nke a ganyekọtara ya na ụdọ igwe ahụ.
2CH 3:17 O guzobere ogidi abụọ ndị ahụ nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ, otu nʼakụkụ ugwu nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Ogidi nke dị na ndịda ka ọ kpọrọ Jakin, ma nke dị nʼugwu ka ọ kpọrọ Boaz.
2CH 4:1 Solomọn wukwara ebe ịchụ aja bronz. Ogologo ya ruru iri mita na ọkara. Obosara ya rukwara iri mita na ọkara; ma ịdị elu ya dị mita ise na ụma atọ.
2CH 4:2 O mekwara Oke osimiri nke ọla awụrụ awụ, nke dị gburugburu nʼụdịdị. Ọtụtụ ya bụ ihe ruru mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, dịkwa mita ise na ụma atọ, site nʼotu ọnụ ruo nʼọnụ nke ọzọ. Ọ bụ eriri e ji atụ ihe nke ruru ihe dịka mita iri na anọ ka e ji tụọ ya gburugburu.
2CH 4:3 Nʼokpuru ọnụ ya, oyiyi ụmụ oke ehi gbara ya gburugburu, iri dị na mita anọ na ọkara ọbụla. Ehi ndị ahụ dị nʼahịrị abụọ. A wụkọtara ha na Oke osimiri ahụ otu mgbe.
2CH 4:4 E mekwara ka Oke osimiri ahụ guzo nʼelu ehi iri na abụọ. Atọ na-eche ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼọdịda anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼakụkụ ndịda, atọ na-eche ihu nʼakụkụ ugwu. Oke osimiri ahụ dịkwasịrị ha nʼelu, ebe azụ ha niile dị nʼime nʼetiti.
2CH 4:5 Ịdị arọ ya ha ka otu ọtụtụ ntu-aka dimkpa. E mere ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko mmiri, dịkwa ka okoko lili na-awapụta awapụta. Ọ na-erite puku galọọnụ iri na asatọ.
2CH 4:6 A kpụkwara efere ukwu iri nke e ji asacha ihe e wetara maka ịchụ aja nsure ọkụ. Ise nʼime ha dị nʼakụkụ ndịda olulu mmiri ahụ, ise nʼakụkụ ugwu. Ndị nchụaja na-esite naanị na olulu mmiri ahụ ekuru mmiri ha ji asacha ihe.
2CH 4:7 Ọ kpụrụ ihe ịdọba oriọna ọlaedo iri nʼusoro dịka Chineke nyere ya nʼiwu. O debere ha nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, ise nʼakụkụ ndịda ụlọ ahụ, ise nʼakụkụ nke ugwu.
2CH 4:8 O mekwara tebul iri dọnye nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ise nʼakụkụ ndịda, ise nʼakụkụ ugwu. Ọ kpụkwara otu narị efere ọlaedo maka ịkwọsa mmiri.
2CH 4:9 Ọ mere ogige ndị nchụaja, mekwa otu ogige ukwuu, na ibo ọnụ ụzọ maka itinye nʼogige ahụ. O jiri bronz machie ibo ọnụ ụzọ ndị ahụ.
2CH 4:10 Oke osimiri ahụ ka ọ dọbara nʼakụkụ ndịda, na ncherita ihu ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ahụ.
2CH 4:11 Huram kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ dị nʼụlọnsọ Chineke, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ.
2CH 4:12 Ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ abụọ dịka efere dị nʼelu ogidi abụọ ahụ; Ihe ọkpụkpụ yiri ụdọ a tụrụ atụ nke e ji chọọ ihe ọkpụkpụ abụọ ahụ dịka efere mma;
2CH 4:13 narị anọ nke mkpụrụ pomegranet a kpụrụ akpụ maka ahịrị ihe abụọ ahụ a kpụrụ akpụ, ya bụ, ahịrị pomegranet abụọ nʼihi otu ihe ọkpụkpụ, iji chọọ ihe ọkpụkpụ ahụ yiri efere dị nʼisi elu ogidi ahụ mma;
2CH 4:14 ihe ndọkwasị na efere ịsa mmiri ha,
2CH 4:15 na Oke osimiri ahụ na ehi iri na abụọ ahụ dị ya nʼokpuru,
2CH 4:16 na ite niile, shọvel niile, ihe ịgụrụ anụ niile na ihe ngwongwo ndị ọzọ ya na ha so. Ihe niile nke Huram-Abi mere eze Solomọn nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ bronz e hichaziri nke ọma.
2CH 4:17 Ọ bụ nʼala ụrọ, nʼobosara ala Jọdan, nʼetiti Sukọt na Zaretan, ka eze mere ka a nọrọ kpụọ ihe ndị a.
2CH 4:18 Ihe ndị a niile nke Solomọn mere dị ukwuu nke ukwu; nke bụ na-enweghị ike ịgụkọta ihe ịdị arọ nke bronz ahụ bụ.
2CH 4:19 Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Chineke, ya bụ, ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, na tebul niile nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị,
2CH 4:20 ihe ịdọkwasị oriọna niile nke ọlaedo a nụchara anụcha, ha na oriọna ha niile, ka ọ na-enwu nʼihu ime ime ebe nsọ, dịka e nyere nʼiwu,
2CH 4:21 ihe ịchọ mma oyiyi okoko osisi, na oriọna niile na ihe ịgụta ihe niile. E ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ha niile.
2CH 4:22 Ọ kpụkwara ihe ịkpakepụ ọkụ niile nke ọlaedo a nụchara anụcha, na efere ịkwọsa mmiri niile, na ngaji niile, na ihe ịgụ ọkụ niile, na ibo ọlaedo niile nke ụlọnsọ, ya bụ, ibo ọnụ ụzọ ime ime niile nke dịrị Ebe ahụ Kachasị Nsọ, na ibo ndị dị nʼọnụ ụlọ ezumezu.
2CH 5:1 Mgbe a rụzuru ọrụ niile nke eze Solomọn nwere ịrụ maka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, o webatara ihe niile Devid bụ nna ya doro nsọ nʼime ya, ya bụ ọlaọcha, ọlaedo na ngwongwo ndị ọzọ niile. O tinyere ha nʼụlọakụ dị nʼụlọnsọ Chineke.
2CH 5:2 Mgbe ahụ, Solomọn kpọkọtara ndị okenye Izrel niile, na ndịisi ebo Izrel niile, na ndịisi ezinaụlọ Izrel niile na Jerusalem, maka ị site na Zayọn, bụ obodo Devid bugota igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
2CH 5:3 Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute eze nʼoge a na-eme mmemme nʼọnwa Etanim, nke bụ ọnwa asaa nʼafọ.
2CH 5:4 Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị Livayị buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ.
2CH 5:5 Ha bugotara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ya na ụlọ nzute, na ngwongwo niile dị nsọ dị nʼime ya. Ndị nchụaja bụ ndị Livayị buliri ha elu.
2CH 5:6 Eze Solomọn na ọgbakọ Izrel niile, bụ ndị zukọtara nʼebe ọ nọ, nọ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na-achụ aja ọtụtụ atụrụ na ọtụtụ ehi nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ gbakọta ọnụọgụgụ ha nʼihi ịba ụba.
2CH 5:7 Ndị nchụaja bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼime Ebe Kachasị Nsọ, dọba ya nʼokpuru nku cherubim ahụ.
2CH 5:8 Cherubim ndị ahụ gbasara nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, kpuchie ya na okporo osisi ndị ahụ e ji ebu ya.
2CH 5:9 Okporo osisi ndị a dị oke ogologo, na isi ha sitere nʼigbe ọgbụgba ndụ ahụ na-apụta, na e nwere ike ị site nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ hụ ha anya, ma onye na-anọghị nʼEbe Nsọ ahụ adịghị ahụ ha. Ha ka dịkwa nʼebe ahụ ruo taa
2CH 5:10 O nweghị ihe dị nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, karịakwa mbadamba nkume abụọ ahụ Mosis tinyere nʼime ya nʼugwu Horeb, nʼebe Onyenwe anyị na ụmụ Izrel gbara ndụ, mgbe ha si nʼala Ijipt pụta.
2CH 5:11 Mgbe ndị nchụaja sitere nʼEbe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ pụta, nʼihi na ndị nchụaja ahụ niile doro onwe ha nsọ nʼagbanyeghị usuu nke onye ọbụla nʼime ha si pụta.
2CH 5:12 Ma ndị Livayị bụ ndị ọbụ abụ, ya bụ Asaf, Heman, Jedutun na ụmụ ha ndị ikom na ndị ikwu ha guzoro onwe ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja. Ha yi uwe ezi akwa ọcha ma na-akpọ ụbọ akwara, na-akụkwa ogene ọla. Ndị nchụaja dị otu narị na iri abụọ (120) nʼọnụọgụgụ. Ndị na-afụ opi sokwa ha.
2CH 5:13 Ndị ọbụ abụ ahụ na ndị na-afụ opi jikọrọ onwe ha ọnụ were otu olu bụkuo Onyenwe anyị abụ ekele na otuto. Ndị na-afụ opi, na ndị na-akụ ọla na-ada ụda, na ndị ji ngwa egwu ndị ọzọ sonyeere ha, welie olu ha elu too Onyenwe anyị nʼabụ sị: “Nʼihi na Ọ dị mma Ịhụnanya ya na-adị ruo ebighị ebi.” Mgbe ahụ igwe ojii jupụtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị,
2CH 5:14 nke mere na ndị nchụaja enwekwaghị ike jee ozi ha, nʼihi igwe ojii ahụ, nʼihi na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼime ụlọnsọ Chineke.
2CH 6:1 Mgbe ahụ, Solomọn sịrị, “Onyenwe anyị ekwuola na ọ ga-ebi nʼoke igwe ojii.
2CH 6:2 Ma ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi!”
2CH 6:3 Dịka ọgbakọ Izrel niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha.
2CH 6:4 Mgbe ahụ ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye ji aka ya abụọ mezuo nkwa ahụ o ji ọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị,
2CH 6:5 ‘Site nʼụbọchị ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta ndị m, ahọpụtaghị m obodo ọbụla nʼebo ọbụla nke Izrel, ka e wuru m ụlọnsọ ka Aha m dịrị nʼebe ahụ, maọbụ họpụta onye ọbụla ka ọ bụrụ onyendu ndị m Izrel.
2CH 6:6 Ma ugbu a, a họrọla m Jerusalem ka ọ bụrụ ebe Aha m ga-adị, ahọrọkwala m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’
2CH 6:7 “Nna m, Devid bu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.
2CH 6:8 Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi, iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.
2CH 6:9 Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ya, kama nwa gị nwoke nke si nʼahụ gị pụta ga-ewu ụlọnsọ ahụ nye Aha m.’
2CH 6:10 “Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna Devid, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.
2CH 6:11 Nʼebe ahụ ka m dọbara igbe ọgbụgba ndụ, nʼime ya ka ọgbụgba Onyenwe anyị dị, bụ nke ya na ụmụ Izrel gbara.”
2CH 6:12 Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ.
2CH 6:13 Solomọn ji bronz kpụọ ihe nrigoro ịnọ gwa ọha mmadụ okwu. Ogologo ihe nrigoro ahụ, obosara ya ruru mita abụọ na ọkara mita abụọ na ọkara. Ịdị elu ya ruru otu mita na ọkara. O debere ya nʼetiti ebe mpụta nke ogige ụlọnsọ ukwu ahụ. O guzoro nʼelu ihe nrigo ahụ, nʼihu ọgbakọ Izrel niile, gbuo ikpere nʼala, gbasaa aka ya abụọ chilie ha elu.
2CH 6:14 Ọ sịrị, “Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe maọbụ nʼụwa. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị.
2CH 6:15 I mezuokwala nkwa niile i kwere nna m Devid, bụ ohu gị. I ji ọnụ gị kwee nkwa a, ma taa, i jirila aka gị mezuo ya.
2CH 6:16 “Ugbu a, O! Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, mezukwaa nkwa niile i kwere Devid nna m, mgbe ị sịrị, ‘Ọ bụrụ na ụmụ ụmụ gị elezie anya bie ndụ dịka iwu m si dị nʼihu m, nʼihe niile ha na-eme, dịka gị onwe gị mere, agaghị achọ onye ga-anọ nʼihu nʼocheeze Izrel nʼime ha.’
2CH 6:17 Ma ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, ka okwu gị, bụ nkwa nke i kwere ohu gị Devid bịa na mmezu.
2CH 6:18 “Ma ọ bụ ezie na Chineke ga-ebinyere ụmụ mmadụ nʼelu ụwa? Lee, eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị!
2CH 6:19 Ma Onyenwe anyị Chineke m, ṅaa ntị nʼekpere ohu gị, na arịrịọ ọ na-arịọ maka ebere. Nụrụ akwa na ekpere nke ohu gị na-ekpe nʼihu gị.
2CH 6:20 Biko, mee ka anya gị abụọ ghere oghe nʼebe ụlọnsọ ukwu a dị, ehihie na nʼabalị, bụ ebe a i kwuru sị, na i ga-akpọkwasị Aha gị nʼebe ahụ. Biko, ka ị nụrụ ekpere ohu gị ga-ekpe banyere ebe a.
2CH 6:21 Nụrụkwa arịrịọ niile nke ohu gị na nke ndị gị Izrel niile, mgbe ọbụla ha chere ihu ha nʼebe a nʼekpere. Biko, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ, mgbe ị nụrụ biko, gbagharakwa.
2CH 6:22 “Mgbe onye ọbụla mehiere mmadụ ibe ya, a kpọọ ya oku ka ọ bịa ṅụọ iyi, onye dị otu a bịa guzo nʼebe a, nʼihu ebe ịchụ aja gị a, ṅụọ iyi ahụ,
2CH 6:23 mgbe ahụ, nụrụ olu ya nʼeluigwe ma mee ihe ziri ezi, kpeekwa ikpe nʼetiti ndị ohu gị. Maa onye mejọrọ ikpe site nʼịtụkwasị nʼisi ha ihe o metara, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya, site nʼimeso ha dịka ezi omume ha si dị.
2CH 6:24 “Mgbe ndị iro meriri ndị gị Izrel, nʼihi na ha mehiere megide gị, ọ bụrụ na ha alọghachite, too aha gị, na-ekpe ekpere, na-arịọ arịrịọ nʼihu gị nʼụlọnsọ ukwu a,
2CH 6:25 biko, site nʼeluigwe nụrụ ekpere ha, gbaghara mmehie ndị gị Izrel. Meekwa ka ha lọghachita nʼala ahụ nke i nyere ha na nna nna ha.
2CH 6:26 “Mgbe e gbochiri eluigwe, mee na mmiri adịghị ezokwa, nʼihi na ndị gị emehiela megide gị, ọ bụrụ na ha echee ihu nʼebe a kpee ekpere, too aha gị, si na mmehie ha chegharịa, nʼihi na ịtaala ha ahụhụ,
2CH 6:27 biko, site nʼeluigwe nụrụ ma gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, ndị gị Izrel. Kuziere ha ezi ụzọ ha ga-esi bie ndụ ma zidata mmiri ozuzo nʼala ahụ nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha.
2CH 6:28 “Mgbe ụnwụ, maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe ga-adakwasị ala a, maọbụ ọrịa na-eripịa ihe ubi, maọbụ ọmụma ebu; maọbụ igurube, maọbụ ụkpana, maọbụ mgbe ndị iro ga-anọchibido ha nʼobodo ha niile, ihe mbibi niile maọbụ ọrịa ọbụla,
2CH 6:29 ekpere ọbụla maọbụ arịrịọ nke onye ọbụla nʼetiti ndị gị Izrel kpere ma rịọọ, nʼihi ịghọta ihe otiti na ihe mgbu niile, ha gbasapụ aka ha, ma chee ihu ha nʼebe ụlọnsọ ukwu dị;
2CH 6:30 mgbe ahụ, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Gbaghara ma meekwa; mesoo onye ọbụla dịka ihe niile ha na-eme si dị, ebe ọ bụ na ị maara obi ha niile (nʼihi na naanị gị maara obi ụmụ mmadụ),
2CH 6:31 ka ha tụọ egwu gị, jeekwa ije nʼirubere gị isi nʼoge niile ha na-ebi nʼala ahụ nke i nyere nna nna anyị ha.
2CH 6:32 “Ma banyere onye mba ọzọ, onye na-esonyeghị na ndị gị Izrel, kama o si nʼala ebe dị anya bịa nʼihi ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a,
2CH 6:33 mgbe ahụ, site nʼeluigwe ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Mekwaa ihe niile nke onye mba ọzọ ahụ na-arịọ nʼekpere, ka ndị niile nke ụwa mara aha gị, tụọkwa egwu gị, dịka ndị nke gị bụ Izrel na-eme. Ka ha matakwa na-akpọkwasịrị Aha gị nʼụlọ a nke m wuru.
2CH 6:34 “Mgbe ndị gị ga-aga ibu agha megide ndị iro ha, nʼebe ọbụla ị na-eziga ha, mgbe ha chere ihu ha nʼụzọ obodo a nke ị họpụtara na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị, kpee ekpere,
2CH 6:35 mgbe ahụ, site nʼeluigwe nụrụ ekpere na arịrịọ amara ha, mezukwa ihe ha na-arịọ.
2CH 6:36 “Mgbe ha mehiere megide gị, nʼihi na ọ dịghị mmadụ ọbụla na-adịghị emehie, ị wee iwe megide ha, rara ha nyefee nʼaka ndị iro, ndị ga-adọkpụrụ ha nʼagha gaa nʼobodo ọzọ, maọbụ obodo dị anya maọbụ nke dị nso;
2CH 6:37 ọ bụrụ na ha anọrọ nʼala ahụ a dọkpụrụ ha gaa, chegharịa nʼobi ha, nọrọ nʼala ebe a dọtara ha nʼagha, rịọọ gị, sị, ‘Anyị emehiela, anyị emeela ihe nʼadịghị mma, meekwa ajọ omume.’
2CH 6:38 Ọ bụrụ na ha ejiri obi ha na mmụọ ha niile chegharịa, nʼala ebe ndọta nʼagha ha, bụ ebe a kpọrọ ha gaa, ma kpee ekpere nye gị chee ihu ha nʼụzọ ala a nke i nyere nna nna ha, nʼobodo a nke ị họpụtara, ya na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị
2CH 6:39 mgbe ahụ, site nʼeluigwe, ebe obibi gị, nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha niile, nyekwara ha aka. Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị.
2CH 6:40 “Ugbu a, Chineke m, biko ka anya gị na ntị gị ghere oghe nʼekpere niile a na-ekpe nʼebe a.
2CH 6:41 “Ma ugbu a, bilie, O Onyenwe anyị Chineke, bata nʼebe izuike gị,
2CH 6:42 O Onyenwe anyị Chineke, agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ.
2CH 7:1 Ngwangwa, mgbe Solomọn kpesịrị ekpere a, ọkụ sitere nʼeluigwe daa repịa aja nsure ọkụ ahụ na aja ahụ niile. Ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼụlọnsọ ukwu ahụ,
2CH 7:2 Ndị nchụaja enweghị ike ịbanye nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nʼihi ebube Onyenwe anyị nke jupụtara ụlọnsọ ahụ.
2CH 7:3 Mgbe ọha ndị Izrel niile hụrụ ọkụ ahụ si nʼelu daa, hụkwa ebube Onyenwe anyị ka o guzo nʼelu ụlọnsọ ukwu ahụ, ha dara nʼala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị, kelee ya ekele sị: “Nʼihi na Ọ dị mma ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
2CH 7:4 Mgbe ahụ, eze na ndị a niile chụrụ aja dị iche iche nʼihu Onyenwe anyị.
2CH 7:5 Eze Solomọn chụrụ aja ehi nke dị puku iri abụọ na abụọ, na ewu na atụrụ dị narị puku na iri abụọ. Ya mere, Eze na ndị ahụ niile si otu a doo ụlọnsọ Chineke nsọ.
2CH 7:6 Ndị nchụaja guzo nʼihu ọrụ ha, ha na ndị Livayị. Ha jiri ngwa egwu Onyenwe anyị nke eze Devid mere maka ị na-eto Onyenwe anyị, bụkwa nke o ji mgbe o nyere ekele, na-asị, “Ịhụnanya ya na-adị ruo ebighị ebi.” Na ncherita ihu ndị Livayị, ndị nchụaja fụrụ opi ike ha mgbe ndị Izrel guzooro ọtọ.
2CH 7:7 Mgbe ahụ, Solomọn doro etiti ogige dị nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ nsọ. Nʼebe ahụ ka ọ nọ chụọ aja nsure ọkụ, aja onyinye mkpụrụ ọka na aja abụba udo. O mere nke a nʼihi na ebe ịchụ aja bronz nke ọ rụrụ enweghị ike ịbata aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka niile nakwa aja abụba ndị ahụ.
2CH 7:8 Ya mere, Solomọn mere mmemme a nʼoge ahụ, ụbọchị asaa, ya na ndị Izrel niile. Ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na Lebo Hamat ruo na mmiri iyi Ijipt.
2CH 7:9 Nʼụbọchị nke asatọ, ha nwere ọgbakọ, nʼihi na ha mere mmemme nke ido ebe ịchụ aja nsọ nʼime ụbọchị asaa, meekwa mmemme ahụ abalị asaa ọzọ.
2CH 7:10 Ya mere, nʼụbọchị nke iri abụọ na atọ nʼọnwa nke asaa, o zilagara ndị ahụ niile nʼụlọ ha, nʼịṅụrị ọṅụ na obi ụtọ nʼihi ihe ọma niile nke Onyenwe anyị Devid na Solomọn na ndị ya Izrel.
2CH 7:11 Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, mezukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nakwa nʼụlọeze nke ya onwe ya.
2CH 7:12 Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọhụ abalị sị ya, “Anụla m ekpere gị, ahọrọkwala m ebe a nye onwe m, ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja.
2CH 7:13 “Mgbe ọbụla m mere ka mmiri ghara izo, maọbụ zidata igurube ka ha bịa bibie ihe ubi unu, maọbụ zidata ọrịa nʼetiti unu,
2CH 7:14 ọ bụrụ na ndị m ndị a kpọkwasịrị aha m, ewedata onwe ha nʼala, kpee ekpere, chọsie ihu m ike, sitekwa na mmehie ha chigharịa, aga m esite nʼeluigwe za ekpere ha, gbaghara ha mmehie ha, mee ka ala ha dịrị ndu.
2CH 7:15 Anya m ga-eghere oghe mgbe niile; otu a kwa, ntị m ga-egherekwa oghe ịhụ na ịnụ ekpere niile a na-ekpe nʼụlọnsọ a.
2CH 7:16 Edoola m ụlọnsọ a nsọ nye onwe m, ka Aha m dị nʼebe ahụ ruo ebighị ebi; anya m abụọ na obi m ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile.
2CH 7:17 “Ma gị onwe gị, bie ndụ nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu m dịka Devid nna gị mere, na-eme ihe niile m nyere nʼiwu, debe ụkpụrụ m na iwu m niile.
2CH 7:18 Aga m eme ka ocheeze ọchịchị gị guzosie ike, dịka mụ na nna gị Devid gbara na ndụ, mgbe m sịrị, ‘Ị ghaghị inwe onye nnọchite anya nʼocheeze nke ga-achị Izrel.’
2CH 7:19 “Ma ọ bụrụ unu alaghachi azụ, gbakụta ụkpụrụ na iwu niile, bụ nke m nyere unu azụ, pụọ gbasoro chi ndị ọzọ ife ha ofufe, na ịkpọ isiala nye ha,
2CH 7:20 mgbe ahụ, aga m esite nʼala m, bụ nke m nyere ha, hopu Izrel. Aga m ajụkwa ụlọnsọ a m doro nsọ nye Aha m, meekwa ka ọ ghọọ ihe e ji atụ ilu na ihe ịkpa ọchị nʼetiti ndị niile.
2CH 7:21 Ọ bụ ezie na ụlọnsọ ukwu a kachasị elu ugbu a, ma ọnọdụ ya ga-eju ndị niile ga-esi nʼakụkụ ya gafee anya, ha ga-asị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ala a na ụlọnsọ a, ihe dị otu a?’
2CH 7:22 Ndị mmadụ ga-aza, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị, Chineke nna nna ha, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’ ”
2CH 8:1 Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị na ụlọeze nke ya onwe ya,
2CH 8:2 Solomọn wugharịrị obodo ndị ahụ Hiram nyere ya, mee ka ndị Izrel biri nʼime ha.
2CH 8:3 Solomọn gara Hamat-Zoba, merie ha.
2CH 8:4 O wuru obodo Tadmọ nke dị nʼọzara na ọtụtụ obodo nchịkọba ihe na Hamat.
2CH 8:5 O wugharịkwara obodo Bet-Horon nke dị nʼelu elu, wuokwa Ndịda Bet-Horon ka ọ ghọọ obodo e wusiri ike nke nwere mgbidi, ibo ọnụ ụzọ ama na mkpọrọ e ji kpọchie ha.
2CH 8:6 O wukwara obodo Baalat na obodo niile nke ebe ịchịkọba ihe, na obodo niile ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị.
2CH 8:7 Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Het, ndị Amọrait, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị a abụghị ndị Izrel),
2CH 8:8 ndị ụmụ ụmụ ha fọdụrụ nʼala ahụ, ndị ahụ ndị Izrel na-ebibighị, ndị a ka Solomọn mere ndị ọrụ mmanye na ndị ohu, nke a bụkwa ọnọdụ ha ruo taa.
2CH 8:9 Ma Solomọn emeghị ka onye Izrel ọbụla bụrụ ohu, maka ọrụ ya, kama ha bụ ndị ikom agha, ndịisi ndị ọchịagha ya, ndịisi ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya agha ya.
2CH 8:10 Ha bụkwa ndịisi ozi nke eze Solomọn, narị ndị ikom abụọ na iri ise bụ ndịisi na-elekọta ndị mmadụ.
2CH 8:11 Solomọn kpọpụtara ada Fero site nʼobodo Devid, gaa nʼụlọeze nke o wuuru ya, nʼihi na ọ sịrị, “Nwunye m agaghị ebi nʼụlọeze Devid, bụ eze Izrel, nʼihi na ebe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị banyere abụrụla ebe dị nsọ.”
2CH 8:12 Emesịa, Solomọn chụrụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke o wuru nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu ahụ,
2CH 8:13 ọbụladị dịka iwu metụtara aja e kwesiri ịchụ kwa ụbọchị si dị, bụ nke Mosis nyere nʼiwu. Aja ndị a bụ maka Ụbọchị Izuike, Ọnwa Ọhụrụ na ụdị mmemme atọ a na-eme nʼafọ, ndị bụ mmemme achịcha ekoghị eko, mmemme izu ụka asaa na mmemme ụlọ Ikwu.
2CH 8:14 O sitere nʼusoro ije ozi nke Devid, họpụtara otu ndị nchụaja ọrụ dị iche iche ha na-arụ ụbọchị niile. O nyekwara ndị Livayị ọrụ idu nʼotuto a na-enye Chineke na inyere ndị nchụaja aka ime ihe ụbọchị ọbụla nʼụbọchị ya. Kenyekwa ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ niile nche oke ọrụ ha nʼotu nʼotu, nʼihi na nke a bụ ihe Devid, onye nke Chineke nyere nʼiwu.
2CH 8:15 Ha ewezugaghị onwe ha nʼiso iwu niile eze nyere ndị nchụaja maọbụ ndị Livayị banyere ihe ọbụla na ihe gbasakwara ụlọakụ niile.
2CH 8:16 A rụzuru ọrụ niile Solomọn zubere ịrụ, site nʼụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị tutu ruo mgbe ewuchara ya. Ya mere, e wuchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2CH 8:17 Mgbe ahụ, Solomọn gara Eziọn Geba na Elat nke dị nʼọnụ osimiri, nʼala Edọm.
2CH 8:18 Hiram zigaara ya ọtụtụ ụgbọ mmiri nke ndị ikom ya na-anya ụgbọ mmiri na-edu, bụ ndị maara ihe banyere ime njem nʼosimiri nke ọma. Ndị a, ha na ndị ikom Solomọn nyaara ụgbọ gaa Ọfịa site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn, ọlaedo ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na ise na narị atọ.
2CH 9:1 Mgbe eze nwanyị Sheba nụrụ akụkọ Solomọn, ọ bịara Jerusalem ka o were ọtụtụ ajụjụ siri ike nwalee ya. O du ọtụtụ ndị ozi bara ụba bịa, tinyere ọtụtụ ịnyịnya kamel ndị bu ụda dị iche iche, ọtụtụ ọlaedo na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche. Ọ bịakwutere Solomọn, ya na ya kparịtara ụka banyere ihe niile nke dị ya nʼobi.
2CH 9:2 Solomọn zara ya ajụjụ ya niile. Ọ dịkwaghị ihe siiri ya ike ịkọwara ya.
2CH 9:3 Mgbe eze nwanyị Sheba hụrụ amamihe Solomọn, ma hụkwa ụlọeze o wuru,
2CH 9:4 na ihe oriri a na-adọkwasị nʼelu tebul ya, usoro ọnọdụ nke ndịisi ọchịchị ya, na ndị guzo na-ejere ya ozi nʼuwe ha yi, ndị na-ebu iko ihe ọṅụṅụ nʼuwe ha, na aja nsure ọkụ niile ọ na-achụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ọ dịkwaghị ihe ọzọ ọ maara ọ ga-eme, maọbụ kwuo.
2CH 9:5 Ọ sịrị eze, “Akụkọ niile m nọ nʼala nụ banyere ihe niile ị rụpụtara na amamihe gị bụ eziokwu.
2CH 9:6 Ma ekwenyeghị m ihe ha kwuru tutu ruo mgbe m bịara jiri anya m abụọ hụ ha. Nʼezie, ihe m nụrụ erughị ọkara nke ịdị ukwuu amamihe gị. Ị tụkwasịla ihe nʼakụkọ m nụrụ.
2CH 9:7 Lee, ụdị ọṅụ ndị gị na-enwe. Lee, ụdị ọṅụ nke ndị ozi na-enwe, bụ ndị na-eguzo nʼihu gị mgbe niile na-anụ okwu amamihe gị.
2CH 9:8 Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke gị, onye nwere mmasị nʼebe ị nọ. O debere gị nʼocheeze ya dịka eze ịchị nʼaha Onyenwe anyị bụ Chineke gị. Nʼihi ịhụnanya nke Chineke gị nwere nʼebe Izrel nọ, na mmasị ya ime ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. O meela gị eze ha, ka ị debe ikpe ziri ezi na ezi omume.”
2CH 9:9 Emesịa, O nyere Solomọn onyinye ọlaedo ịdị arọ ya dị puku kilogram anọ, nyekwa ya ụda dị iche iche, na nkume oke ọnụahịa dị iche iche. Enwebeghị ụdị ụda dịka ndị ahụ eze nwanyị Sheba nyere eze Solomọn.
2CH 9:10 Ndị ohu Hiram na ndị ohu Solomọn bubatara ọlaedo site nʼỌfịa. Ha butekwara osisi algụm, na nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche.
2CH 9:11 Eze ji osisi algụm ndị ahụ mee nkwasa nrigo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke ụlọeze. O jikwa ya meere ndị na-abụ abụ ụbọ akwara na une. O nwebeghị oge ọzọ e nwere ụdị ngwa egwu e ji osisi ọma dị otu a kwaa nʼala Juda niile.
2CH 9:12 Eze Solomọn nyekwara eze nwanyị Sheba ihe niile ọ chọrọ na ihe niile bụ nke ọ rịọrọ. O nyere ya karịa ihe niile o wetaara ya. Emesịa, ọ hapụrụ laghachi nʼala nke aka ya, ya na ndị na-ejere ya ozi.
2CH 9:13 Ọtụtụ ịdị arọ nke ọlaedo Solomọn na-enweta kwa afọ bụ puku kilogram iri abụọ na atọ,
2CH 9:14 na-agụnyeghị uru nke na-esi nʼaka ndị na-atụ mgbereahịa na ndị na-azụ ahịa. Ọzọkwa, ndị eze niile nke dị Arebịa na ndịisi na-achị obodo niile nke ala ahụ, na-enwetara Solomọn ọlaọcha na ọlaedo.
2CH 9:15 Eze Solomọn kpụrụ narị ọta ọlaedo ukwu abụọ site nʼọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram isii ka e ji kpụọ ọta ọbụla.
2CH 9:16 Ọ kpụkwara narị ọta nta atọ, nke sitere na ọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram atọ na ọkara ka eji kpụọ ọta ọbụla. Eze debere ha nʼụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn.
2CH 9:17 Eze mekwara ocheeze dị ukwu nke e ji ọdụ enyi na ọlaedo a nụchara anụcha machie
2CH 9:18 Ocheeze ahụ nwere ihe nrigo isii na ihe ịtụkwasị ụkwụ eji ọlaọcha rụọ nke ejikọtara nʼahụ ya. E nwere ebe ntụkwasị aka nʼakụkụ abụọ ya, nke nwere oyiyi ọdụm abụọ guzo nʼakụkụ nke ọbụla nʼime ha.
2CH 9:19 Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye.
2CH 9:20 Ihe niile Solomọn nwere nke e ji aṅụ ihe bụ ọlaedo ka e ji mee ha. Ngwongwo niile nke dị nʼime ụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji kpụọ ha. Ọ dịghị ihe e ji ọlaọcha kpụọ, nʼihi na-agụnyeghị ọlaọcha dịka ihe ọbụla nʼoge Solomọn.
2CH 9:21 Eze nwere ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa nke ndị ohu Hiram na-elekọta. Otu ugbo nʼafọ atọ, ka ụgbọ ndị a na-alọta buru ọlaedo, ọlaọcha na ọdụ enyi, enwe na adaka dị iche iche bata.
2CH 9:22 Eze Solomọn bara ụba nʼakụ, nweekwa amamihe karịa ndị eze niile dị nʼụwa.
2CH 9:23 Ndị eze niile nke ụwa na-achọ ihu Solomọn, ka ha nụta okwu amamihe nke Chineke tinyere nʼobi ya.
2CH 9:24 Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, na uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ.
2CH 9:25 Solomọn nwere ụlọ anụmanụ dị puku anọ maka ịnyịnya na ụgbọ agha, nwekwa puku ịnyịnya iri na abụọ ndị o dobere nʼobodo ụgbọ agha dị iche iche, na nʼebe eze nọ na Jerusalem.
2CH 9:26 Ọ chịrị ndị eze niile site nʼosimiri Yufretis ruo nʼala ndị Filistia, rukwaa oke ala ndị Ijipt.
2CH 9:27 Eze mere ka ọlaọcha baa ụba na Jerusalem, dịka nkume efu. O mekwara ka osisi sida dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche.
2CH 9:28 A na-esite nʼIjipt na nʼala ndị ọzọ dị iche iche atụbatara Solomọn ịnyịnya.
2CH 9:29 Ma banyere Ihe ndị ọzọ mere nʼoge ọchịchị Solomọn, site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ Netan onye amụma, nʼime akwụkwọ amụma Ahija, onye Shilo, nakwa nʼọhụ Ido onye ọhụ ụzọ, banyere Jeroboam nwa Nebat?
2CH 9:30 Solomọn chịrị Izrel niile iri afọ anọ na Jerusalem.
2CH 9:31 O sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ. E lie ya nʼobodo Devid bụ nna ya. Rehoboam nwa ya ghọkwara eze nʼọnọdụ ya.
2CH 10:1 Rehoboam gara Shekem nʼihi na Izrel niile zukọrọ ebe ahụ ime ya eze.
2CH 10:2 Mgbe Jeroboam nwa Nebat nụrụ nke a (ọ nọ nʼIjipt ebe ọ gbagara ọsọ ndụ site nʼaka eze Solomọn) o sitere Ijipt lọta.
2CH 10:3 Ya mere, ha ziri ozi kpọọ Jeroboam, ya na ndị Izrel niile jekwuru Rehoboam sị ya:
2CH 10:4 “Nna gị boro anyị ibu arọ, ma ugbu a mee ka ibu arọ na ịyagba arọ a nke o bokwasịrị anyị dị mfe, anyị ga-ejere gị ozi.”
2CH 10:5 Rehoboam zara ha sị, “Bịaghachikwutenụ m mgbe ụbọchị atọ gasịrị.” Nʼihi ya ndị ahụ lara.
2CH 10:6 Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ ya, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?”
2CH 10:7 Ha zara ya, “Ọ bụrụ na ị ga-emere ha ihe ọma, mee ihe ga-atọ ha ụtọ, nyekwa ha ọsịsa dị mma, ha ga-anọgide bụrụ ndị ohu gị mgbe niile.”
2CH 10:8 Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ.
2CH 10:9 Rehoboam jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ndụmọdụ unu? Gịnị bụ ọsịsa anyị ga-enye ndị a na-asị, ‘Mee ka ibu arọ nna gị bokwasịrị anyị dị mfe’? ”
2CH 10:10 Ụmụ okorobịa ahụ, bụ ndị ya na ha tokọrọ, zaghachiri sị, “Gwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị bokwasịrị anyị ibu arọ, ma mee ka ibu anyị dị mfe,’ ị ga-agwa ha, sị, ‘Mkpịsịaka nta dị nʼaka m gbara okpotokpo karịa ukwu nna m.
2CH 10:11 Nna m boro unu ibu arọ; aga m atụkwasị ihe nʼibu ahụ mee ka ọ dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, maọbụ akpị ka m ga-eji mekpaa unu ahụ.’ ”
2CH 10:12 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jeroboam na ndị Izrel niile bịaghachiri ịnụrụ ọsịsa Rehoboam, dịka eze kwuru, sị, “Laghachitenụ nʼụbọchị nke atọ.”
2CH 10:13 Eze sara ha okwu nʼolu dị ike. Ọ jụrụ ndụmọdụ ndị okenye
2CH 10:14 ma gbasoro ndụmọdụ nke ụmụ okorobịa nyere, ọ sịrị, “Nna m mere ka ibu unu dị arọ, aga m eme ka ibu unu dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, aga m eji akpị mekpaa unu ahụ.”
2CH 10:15 Ya mere, eze aṅaghị ndị ahụ ntị, nʼihi mgbanwe nke ọnọdụ niile a sitere nʼebe Chineke nọ, ka e mezuo okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jeroboam nwa Nebat site nʼọnụ Ahija onye Shilo.
2CH 10:16 Mgbe Izrel niile hụrụ na eze jụrụ ige ha ntị, ha zaghachiri ya sị, “Olee oke anyị nwere nʼime Devid? Olee ihe nketa anyị nwere nʼime nwa Jesi? Ndị Izrel, laanụ nʼụlọ ikwu unu! Gị Devid lekọtakwa ụlọ nke gị.” Nke a mere, ka ndị Izrel niile laa nʼụlọ ha.
2CH 10:17 Ma banyere ndị Izrel bi nʼobodo niile nke Juda, Rehoboam gara nʼihu bụrụ eze ha.
2CH 10:18 Eze Rehoboam zipụrụ Adoniram onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye ma ndị Izrel ji nkume tugbuo ya. Ma eze Rehoboam jisiri ike gbaba nʼime ụgbọ agha ya, gbalaga laa Jerusalem.
2CH 10:19 Ya mere, Izrel nọ na nnupu isi megide ụlọ Devid ruo taa.
2CH 11:1 Mgbe Rehoboam bịarutere Jerusalem, ọ kpọkọtara ndị ụlọ Juda niile na ndị ebo Benjamin, ha dị narị puku na iri asatọ nʼọnụọgụgụ, ụmụ okorobịa ndị tozuru ịga agha, ka ha gaa buso ụlọ Izrel agha ma weghachitekwa alaeze nʼokpuru ọchịchị Rehoboam.
2CH 11:2 Ma okwu Onyenwe anyị rutere Shemaya, onye nke Chineke ntị:
2CH 11:3 “Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na Izrel niile nọ na Juda na Benjamin,
2CH 11:4 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ndị Izrel ibe unu agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme ihe ndị a.’ ” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu niile nke Onyenwe anyị. Ha tụgharịrị laghachi azụ nʼịga megide Jeroboam.
2CH 11:5 Rehoboam bigidere na Jerusalem wusie obodo ndị dị na Juda ike nʼihi nchedo.
2CH 11:6 Obodo ndị a bụ Betlehem, Etam, Tekoa,
2CH 11:7 Bet Zoa, Soko, Adulam,
2CH 11:8 Gat, Maresha, Zif,
2CH 11:9 na Adoraim, Lakish, Azeka
2CH 11:10 Zora, Aijalon na Hebrọn. Obodo ndị a bụkwa obodo ndị Juda na Benjamin e wusiri ike.
2CH 11:11 O wusiri ha ike tinye ndịisi agha nʼime ha, tinyekwa ihe oriri na mmanụ oliv na mmanya.
2CH 11:12 O tinyere ọta na ùbe nʼebe niile a na-edebe ngwa agha nʼobodo niile, nʼihi iche obodo ya nke ọma, ebe ọ bụ naanị Juda na Benjamin nọ nʼokpuru ya.
2CH 11:13 Ma ndị nchụaja niile na ndị Livayị ndị sitere nʼakụkụ niile nke Izrel dịnyere ya.
2CH 11:14 Ndị Livayị hapụchara ebe ịta nri anụ ụlọ ha na ihe niile ha nwere bịa biri na Juda na Jerusalem, nʼihi na Jeroboam na ụmụ ya ndị ikom jụrụ ha dịka ndị nchụaja Onyenwe anyị.
2CH 11:15 Ọ họpụtara ndị nchụaja nke aka ya, maka ebe niile dị elu, nakwa ife arụsị ewu na nwa ehi ndị ahụ ọ kpụrụ.
2CH 11:16 Ndị si nʼebo niile nke Izrel, ndị kpebiri nʼobi ha ịchọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel sooro ndị Livayị bịa Jerusalem ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke nna nna ha.
2CH 11:17 Ha mere ka alaeze Juda sie ike. Ha kwagidekwara Rehoboam nwa Solomọn afọ atọ, na-agbasokwa nʼụzọ niile nke Devid na Solomọn nʼoge a.
2CH 11:18 Rehoboam, lụrụ Mahalat, bụ nwa nwanyị Jerimot nwa Devid, na Abihail, nwa nwanyị Eliab, nwa Jesi.
2CH 11:19 Ọ mụtaara ya ụmụ ndị ikom atọ ndị a: Jeush, na Shemaraya, na Zaham.
2CH 11:20 Emesịa, ọ lụkwara nwunye ọzọ aha ya bụ Maaka, nwa nwanyị Absalọm. Ụmụ ha mụtara bụ Abija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.
2CH 11:21 Rehoboam hụrụ Maaka nwa nwanyị Absalọm nʼanya karịa ndị nwunye ya na ndị iko ya nwanyị niile. O nwere ndị nwunye iri na asatọ, nweekwa iri ndị iko nwanyị isii. Ọ mụtara iri ndị ikom abụọ na asatọ, na iri ụmụ nwanyị isii.
2CH 11:22 Rehoboam mere Abija nwa Maaka onyeisi nʼetiti ụmụ eze niile nʼihi na ọ chọrọ ime ya eze.
2CH 11:23 O ji ezi uche zipụchaa ụmụ ya ndị ikom gaa nʼala ndị Juda na Benjamin, nakwa nʼobodo ndị ahụ e wusiri ike. O nyere ha ihe e ji elekọta ndụ nʼebe ọ bara ụba ma lụọkwara ha ọtụtụ ndị inyom.
2CH 12:1 Ma mgbe e mere ka alaeze Rehoboam guzosie ike, mgbe ọ dịkwa ike, ọ hapụrụ iwu Onyenwe anyị ya na ndị Izrel niile.
2CH 12:2 Nʼihi na ha ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem agha nʼafọ nke ise nke ọchịchị eze Rehoboam.
2CH 12:3 O ji otu puku ụgbọ agha na narị abụọ, na ndị agha na-agba ịnyịnya dị puku iri isii, na ndị agha ụkwụ ala, ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị agha si Libịa, Sukim na Kush, ndị sooro ya site nʼala Ijipt.
2CH 12:4 O merikwara obodo niile e wusiri ike nke Juda ma bịarukwaa Jerusalem.
2CH 12:5 Mgbe ahụ, Shemaya onye amụma bịakwutere Rehoboam na ndịisi Juda niile, ndị zukọtara na Jerusalem nʼihi egwu Shishak, sị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Unu ahapụla m, nʼihi ya, ahapụkwala m unu, nyefee unu nʼaka Shishak.’ ”
2CH 12:6 Ndị ndu Izrel na eze wedara onwe ha nʼala sị, “Onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ.”
2CH 12:7 Mgbe Onyenwe anyị hụrụ otu ha si weda onwe ha nʼala, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Shemaya, sị, “Ebe ọ bụ na ha ewedala onwe ha nʼala, agakwaghị m ebibi ha kama aga m eme ka ha nwe nzọpụta ngwangwa. Agakwaghị m eji Shishak gosi Jerusalem oke iwe m.
2CH 12:8 Ma otu ọ dị, ha ga-abụrụ ya ohu, ka ha nwe ike mata ọ dị iche dị nʼetiti ijere m ozi na ijere ndị eze ala ọzọ dị iche iche ozi.”
2CH 12:9 Mgbe Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem nʼagha; o bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo ndị ahụ Solomọn kpụrụ.
2CH 12:10 Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya.
2CH 12:11 Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-eso ya buru ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche.
2CH 12:12 Mgbe eze wedara onwe ya nʼala, iwe Onyenwe anyị na-eweso ya dajụrụ, Ọ laghịkwa ya nʼiyi kpamkpam. Nʼezie, ezi ihe fọdụkwara na Juda.
2CH 12:13 Eze Rehoboam mere onwe ya ka ọ dị ike na Jerusalem na-achịkwa ka eze. Ọ gbara iri afọ anọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ Onyenwe anyị họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ọ ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn.
2CH 12:14 O mere ihe ọjọọ, nʼihi na ọ dịghị mgbe ọbụla o kpebiri nʼobi ya ịchọ Onyenwe anyị.
2CH 12:15 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Shemaya onye amụma na nke Ido onye ọhụ ụzọ, nke na-ahụ maka ihe banyere usoro ọmụmụ niile? Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha.
2CH 12:16 Rehoboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Abija nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2CH 13:1 Abija malitere ịbụ eze Juda, nʼafọ iri na asatọ nke ọchịchị eze Jeroboam.
2CH 13:2 Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, otu nʼime ụmụ nwanyị Uriel, onye Gibea. Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam.
2CH 13:3 Abija họpụtara ndị ya dị ike nʼagha bụ ndị ọnụọgụgụ ha dị narị puku anọ, ma Jeroboam eze Izrel họpụtara ndị agha ọnụọgụgụ ha dị narị puku asatọ doo ha nʼusoro.
2CH 13:4 Abija guzoro nʼugwu Zemaraim nʼala ugwu ugwu Ifrem jiri oke olu sị “Jeroboam na ndị Izrel niile geenụ m ntị!
2CH 13:5 Unu amataghị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel esitela nʼọgbụgba ndụ nnu nyefee ọchịchị ala Izrel niile nʼaka Devid na ụmụ ụmụ ya ruo ebighị ebi?
2CH 13:6 Ma Jeroboam, nwa Nebat, bụ onye ọrụ Solomọn nwa Devid, nupuru isi megide onyenwe ya.
2CH 13:7 Ndị efu niile na-abaghị uru chịkọtara onwe ha gbaa ya gburugburu guzogide Rehoboam nwa Solomọn, mgbe ọ bụ nwantakịrị na onye na-enweghị ike inwe mkpebi, onye nʼadịghịkwa ike iguzogide ha.
2CH 13:8 “Ma ugbu a, unu ejikerela imegide alaeze Onyenwe anyị nke dị nʼaka ụmụ ụmụ Devid. Nʼezie, unu bu igwe ndị agha bara ụba, nʼetiti unu ka ụmụ ehi ọlaedo ahụ dịkwa, bụ nke Jeroboam mere ka ha buru chi unu.
2CH 13:9 Ma unu achụpụghị ndị nchụaja Onyenwe anyị, bụ ụmụ Erọn, chụpụkwa ndị Livayị ma meere onwe unu ndị nchụaja dịka ndị mba ọzọ na-eme? Onye ọbụla ji nwa oke ehi na ebule asaa bịa ido onwe ya nsọ na-aghọrọ unu onye nchụaja nye ihe ndị ahụ na-abụghị chi.
2CH 13:10 “Ma banyere anyị, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, anyị ahapụbeghị ya. Ndị nchụaja na-ejere Onyenwe anyị ozi bụ ụmụ Erọn, ndị Livayị bụkwa ndị na-enyere ha aka.
2CH 13:11 Ha na-achụ aja nye Onyenwe anyị kwa ụtụtụ na anyasị niile, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ; ma na-edobekwa achịcha edoro nsọ nʼelu tebul ahụ dị ọcha. Ha na-amụnyekwa ọkụ nʼiheọkụ ndị ahụ dị nʼelu ihe ịdọba oriọna ọlaedo kwa abalị niile. Nʼihi na anyị onwe anyị na-edebe iwu Onyenwe anyị Chineke anyị; ma unu onwe unu ahapụla ya, gbakụta ya azụ.
2CH 13:12 Chineke nọnyeere anyị. Ọ bụkwa onyendu anyị. Ndị nchụaja ya ga-eji ịfụ opi ike tie mkpu agha megide unu. Unu ndị Izrel, unu alụsokwala Onyenwe anyị bụ Chineke nna unu ha ọgụ nʼihi na mmeri agaghị abụ nke unu!”
2CH 13:13 Ma Jeroboam ezipụlarị ụfọdụ ndị agha ya ka ha ga ndị agha Juda nʼazụ. Mgbe Jeroboam nọ nʼihu ndị Juda, ụfọdụ ndị agha ya nọkwa ndị Juda nʼazụ.
2CH 13:14 Mgbe ndị agha Juda tụgharịrị hụ na agha dị ha nʼihu dịkwa nʼazụ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu nzọpụta, ndị nchụaja fụkwara opi ike ha.
2CH 13:15 Ndị Juda tiri oke mkpu agha. Mgbe ha na-eti mkpu a, Chineke mere ka Abija na ndị Juda merie Jeroboam na ndị Izrel.
2CH 13:16 Ndị agha Izrel gbara ọsọ nʼihu ndị Juda, Chineke nyefere ha nʼaka ndị Juda.
2CH 13:17 Abija na ndị agha ya gburu narị puku ndị Izrel ise nʼụbọchị ahụ.
2CH 13:18 Ya mere, ntụkwasị obi nke Juda nwere nʼime Onyenwe anyị Chineke nna ha mere ka ha merie Jeroboam na ndị Izrel.
2CH 13:19 Abija chụkwara Jeroboam na ndị agha ya ọsọ dọta obodo ndị a nʼagha: Betel, na Jeshana, na Efrọn, na obodo niile gbara ha gburugburu.
2CH 13:20 Jeroboam enwetakwaghị ike ya ọzọ oge niile Abija nọ dịka eze. Ma ọ dịghị anya Onyenwe anyị tidara ya tigbuo ya.
2CH 13:21 Ma Abija gara nʼihu bụrụ onye dị ike, ọ lụrụ nwunye iri na anọ, mụọ iri ụmụ nwoke abụọ na abụọ, na ụmụ ndị nwanyị iri na isii.
2CH 13:22 Akụkọ niile banyere ọchịchị Abija, ihe o mere na ihe o kwuru, dị nʼakwụkwọ akụkọ nke Ido onye amụma dere.
2CH 14:1 Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. Udo dịkwa afọ iri nʼụbọchị ịbụ eze ya.
2CH 14:2 Asa mere ihe dị mma na nke ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke ya.
2CH 14:3 Ọ wezugakwara ebe ịchụ aja nke chi ọzọ niile dị nʼugwu, tipịa ogidi nsọ niile, gbujasịakwa ogidi Ashera.
2CH 14:4 O nyere Juda iwu ka ha chọọ Onyenwe anyị Chineke nke nna ha, ka ha debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile.
2CH 14:5 O wezugakwara ebe niile a na-efe arụsị nʼelu ugwu, bibiekwa ebe niile a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼobodo Juda. Alaeze ahụ nwekwara udo nʼokpuru ọchịchị ya.
2CH 14:6 O wuru ọtụtụ obodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nʼala Juda niile. O nweghị onye busoro ya agha, nʼihi na Onyenwe anyị nyere ya udo.
2CH 14:7 Nʼihi nke a, ọ gwara ndị Juda sị ha, “Ugbu a ka anyị kwesiri iwu obodo ndị a. Ka anyị wuokwa mgbidi gburugburu ha, wuokwa ụlọ elu nche, tinyesịa ha niile ibo ọnụ ụzọ ama, na mkpọrọ e ji akpọchi ya, ala a bụ nke anyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye anyị ji obi anyị chọsie ike enyela anyị udo.” Ya mere, ha wuru ihe ndị a niile nwekwa ọganihu.
2CH 14:8 Ọnụọgụgụ ndị agha Asa ndị si Juda nʼoge ahụ bụ narị puku atọ. Ngwa agha ha ji bụ ọta ukwu na ùbe. Ndị agha ya ọzọ si Benjamin dị narị puku abụọ na iri puku mmadụ asatọ. Ndị a jikwa ọta na ụta. Ndị agha ndị a niile bụ ndị a zụziri azụzi, bụrụkwa ndị dị ike.
2CH 14:9 Zera, bụ onye Kush duru puku kwụrụ puku, na narị ụgbọ agha atọ, bịaruo Maresha ibuso Juda agha.
2CH 14:10 Asa pụrụ izute ya. Ha doro onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Zefata nke dị Maresha nso.
2CH 14:11 Mgbe ahụ, Asa kpọkuru Onyenwe anyị Chineke ya, si, “Onyenwe anyị ọ dịghị onye dịka gị nʼinyere onye na-adịghị ike aka nʼihu onye dị ike nke ukwuu. Nyere anyị aka, O Onyenwe anyị Chineke anyị, nʼihi na anyị dabere na gị. Ọ bụkwa nʼaha gị ka anyị na-apụ ibuso igwe a agha. O Onyenwe anyị i bụ Chineke anyị. Ekwela ka ọ bụrụ na mmadụ efu meriri gị.”
2CH 14:12 Onyenwe anyị tigbukwara ndị Kush niile ahụ nʼihu Asa na Juda. Ndị Kush gbakwara ọsọ.
2CH 14:13 Asa na ndị agha ya chụrụ ha ọsọ chụruo ha obodo Gera ebe ọtụtụ ndị Kush dara, ruo na o nwekwaghị onye fọdụrụ ndụ nʼime ha. E tigburu ha nʼihu Onyenwe anyị na ndị agha ya. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha dị iche iche.
2CH 14:14 Ha bibiri obodo niile gbara Gera gburugburu, nʼihi na egwu Onyenwe anyị dakwasịrị obodo ndị ahụ niile. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼihi na ọtụtụ ihe dị nʼobodo ndị ahụ.
2CH 14:15 Ha busokwara ebe obibi ndị na-azụ anụ ụlọ agha, chikọrọ igwe atụrụ na ewu na ịnyịnya kamel. Emesịa ha laghachiri Jerusalem.
2CH 15:1 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị Azaraya nwa Oded.
2CH 15:2 Ọ pụrụ jekwuru Asa sị ya, “Geenụ m ntị, gị Asa na ndị Juda niile na Benjamin. Onyenwe anyị ga-anọnyere unu oge niile unu na-eme okwu ya. Unu ga-achọta ya mgbe ọbụla unu chọrọ ya. Ma ọ ga-agbakụta unu azụ oge ọbụla unu nupuru isi nʼiwu ya.
2CH 15:3 Ma ọtụtụ oge dị anya ndị Izrel nọ na-enweghị Chineke nke ezie, ha enweghịkwa onye nchụaja ga-ezi ihe, ha enweghịkwa iwu Chineke
2CH 15:4 Ma mgbe ọbụla ha chigharịkwutere Onyenwe anyị, Chineke Izrel tikuo ya nʼime mkpagbu ha, ọ na-enyere ha aka.
2CH 15:5 Nʼoge ahụ, ọ dịghị udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ ịgagharị nʼobodo, maka na ndị niile bi nʼala ahụ nọ nʼọnọdụ oke ọgbaaghara.
2CH 15:6 Otu obodo na-azọpịa obodo ọzọ ebe otu mba na-emegidekwa mba ọzọ nʼihi na Chineke ji nsogbu dị iche iche megide ha.
2CH 15:7 Ma unu ndị Juda, unu adala mba nʼọrụ ọma unu, nʼihi na a ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ unu.”
2CH 15:8 Mgbe Asa nụrụ okwu ndị a, bụ amụma Azaraya nwa Oded, ọ bụ onye a gbara ume. O wepụrụ ihe arụ niile dị nʼala Juda na Benjamin na nke dị nʼobodo niile ahụ o meriri nʼagha ndị dị nʼugwu Ifrem. Ọ wuziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke dị nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
2CH 15:9 Mgbe ahụ, Asa kpọrọ ndị Juda na Benjamin niile oku, ha na ndị ọbịa niile si Izrel, nʼihi na ọtụtụ sitere nʼala Ifrem na Manase, na Simiọn gbafeta Juda, mgbe ha hụrụ na Onyenwe anyị Chineke nọnyeere Asa.
2CH 15:10 Ha niile zukọrọ na Jerusalem nʼọnwa nke atọ nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị eze Asa.
2CH 15:11 Nʼoge ahụ, ha ji narị ehi asaa na puku atụrụ na ewu asaa, chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼụbọchị ahụ. Anụmanụ ndị a so nʼihe ha kwatara nʼagha.
2CH 15:12 Emesịa, nʼụbọchị ahụ, ha gbara ndụ, kpebie na ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke nna ha ka ha ga-efe.
2CH 15:13 Ha kpebikwara na onye ọbụla nke na-agaghị efe Onyenwe anyị, Chineke Izrel ga-anwụ, ma onye ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, nwantakịrị maọbụ okenye.
2CH 15:14 Ha niile ji oke olu na iti mkpu na opi na opi ike, ṅụọrọ Onyenwe anyị iyi.
2CH 15:15 Ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na ha ji obi ha niile ṅụọ iyi a. Ha jikwa obi ha niile chọọ Chineke. O mere ka ha chọta ya. Onyenwe anyị nyekwara ha udo nʼakụkụ niile.
2CH 15:16 Eze Asa chụdakwara nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya, sụpịa ya, kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn.
2CH 15:17 Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu site nʼIzrel, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile
2CH 15:18 O webatara nʼime ụlọnsọ ukwu Chineke, ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile, nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.
2CH 15:19 Ọ dịkwaghị agha ọzọ a lụrụ tutu ruo nʼafọ iri atọ na ise nke ọchịchị eze Asa na Juda.
2CH 16:1 Nʼafọ nke iri atọ na isii nke ọchịchị Asa, Baasha eze Izrel, busoro Juda agha, wuchie Rema igbochi onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼoke ala Asa, eze Juda.
2CH 16:2 Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị dị nʼụlọeze ya, zigara Ben-Hadad, eze Aram, onye na-achị na Damaskọs, sị,
2CH 16:3 “Biko, ka anyị gbaa ndụ dịka nna m na nna gị mere. Lee, ana m ezitere gị ọlaọcha na ọlaedo. Ugbu a, mebie ọgbụgba ndụ dị nʼetiti gị na Baasha, bụ eze Izrel, ka o si nʼebe m nọ wezuga onwe ya.”
2CH 16:4 Ben-Hadad kwenyere eze Asa, zipụ ndị ọchịagha ndị agha ya ka ha gaa buso obodo Izrel niile agha. Ha lụgburu Ijon, Dan, Ebel-Maim na obodo niile a na-achịkọbata ihe dị na Naftalị.
2CH 16:5 Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, hapụkwa ọrụ ya.
2CH 16:6 Mgbe ahụ, eze Asa chịịrị ndị ikom niile nke Juda. Ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe. O ji ihe ndị a wulie Geba na Mizpa.
2CH 16:7 Nʼoge ahụ Hanani, bụ onye ọhụ ụzọ bịakwutere Asa, bụ eze Juda sị ya, “Ebe ọ bụ na ị hapụrụ Onyenwe anyị Chineke gị, tụkwasị eze Aram obi, lee na usuu ndị agha Siria esitela nʼaka gị wezuga onwe ha.
2CH 16:8 Ndị Kush na ndị Libịa, ha abụghị usuu ndị agha ji ọtụtụ ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya? Ma mgbe ị dabeere na Onyenwe anyị, o nyefere ha nʼaka gị.
2CH 16:9 Nʼihi na anya Onyenwe anyị na-agazu ụwa niile, ịgba ha ume bụ ndị obi ha zuruoke nʼebe ọ nọ. I meela omume nzuzu na nke a, site ugbu a gaa nʼihu ị ga na-enwe agha.”
2CH 16:10 Iwe were Asa megide onye ọhụ ụzọ a nʼihi nke a; iwe were ya nke ukwuu nke mere na ọ tụnyere Hanani nʼụlọ mkpọrọ. Sitekwa nʼoge ahụ, Asa bidoro imekpa ụfọdụ nʼime ndị ya ahụ.
2CH 16:11 Ihe banyere ihe ọzọ niile nʼoge ọchịchị Asa, site na mmalite ruo ọgwụgwụ ka e dere nʼime akwụkwọ ndị eze Juda na Izrel.
2CH 16:12 Nʼime iri afọ atọ na itoolu nke ọchịchị ya, eze Asa rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ. Ọ bụ ezie na ọrịa a siri nọọ ike ma nʼime ọnọdụ ya ọ chọghị enyemaka site nʼaka Onyenwe anyị kama ọ bụ naanị ndị dibịa ka o jekwuru.
2CH 16:13 Asa nwụrụ nʼiri afọ anọ na otu nke ọchịchị eze ya, sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ.
2CH 16:14 Ha liri ya nʼili nke ọ waara onwe ya nʼobodo Devid. Ha dobere ya nʼelu ihe ịdọba ozu nke jupụtara na ụda dị iche iche, na mmanụ na-esi isi ụtọ nke a gwọkọtara nke ọma, surekwara ya ihe nsure ọkụ nʼebe ọ dị ukwuu iji kwanyere ya ugwu.
2CH 17:1 Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya, o mere onwe ya ka ọ dị ike imegide Izrel.
2CH 17:2 O tinyere ụfọdụ ndị agha ya nʼobodo niile dị na Juda e wusiri ike, tinyekwa ụfọdụ nʼobodo ndị ọzọ dị nʼIfrem, na ebe ndị ọzọ niile nke nna ya, Asa meriri nʼagha.
2CH 17:3 Onyenwe anyị nọnyeere Jehoshafat nʼihi na o sooro nzọ ụkwụ nna ya, bụ Devid, onye buuru ya ụzọ chịa. Ọ jụghị ase site nʼaka Baal,
2CH 17:4 kama ọ chọrọ Onyenwe anyị, Chineke nna ya, dobekwa iwu ya niile, ọ bụghịkwa dịka omume ndị Izrel si dị.
2CH 17:5 Nʼihi nke a Onyenwe anyị mere ka ọchịchị ya guzosie ike. Ndị Juda niile tụkwara ụtụ ha dịka o kwesiri wetara Jehoshafat, nke a mere ka o nwee akụnụba ebe ọ dị ukwuu, nwekwa nsọpụrụ.
2CH 17:6 O ji obi ya niile gbasoo ụzọ Onyenwe anyị. Ọzọkwa, o sitere na Juda wezuga ebe niile dị elu nakwa ogidi Ashera niile.
2CH 17:7 Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o zipụrụ ndịisi ọchịchị alaeze ya ndị a, Ben-Hail, Ọbadaya, Zekaraya, Netanel na Mikaya ka ha gaa zie ndị mmadụ ihe nʼobodo niile nke Juda.
2CH 17:8 Ụfọdụ ndị Livayị ndị a sokwa gaa: Shemaya, Netanaya, Zebadaya, Asahel, Shemiramot, Jehonatan, Adonaịja, Tobaija, Tob-Adonaịja na ndị nchụaja ụfọdụ, ndị dị ka Elishama na Jehoram.
2CH 17:9 Ha ji akwụkwọ iwu Onyenwe anyị, zie ihe na Juda. Ha jere gburugburu obodo niile nke Juda na-ezi ndị mmadụ ihe.
2CH 17:10 Egwu Onyenwe anyị dakwasịrị alaeze niile dị gburugburu Juda, nʼihi ya, ha ebukwaghị agha megide Jehoshafat.
2CH 17:11 Ụfọdụ nʼime ndị Filistia wetaara ya onyinye na ọlaọcha kwa afọ nʼụzọ ịkwanyere ya ugwu, ma ndị Arab, wetaara ya igwe anụ ụlọ dị puku ebule asaa na narị asaa, na puku mkpi asaa na narị asaa.
2CH 17:12 Ya mere, Jehoshafat ghọrọ eze dị ike. O wusiri obodo ndị dị na Juda ike, wukwaa obodo ịchịkọba ihe.
2CH 17:13 O nwekwara ihe ndị ọ chịkọbara nʼọtụtụ obodo Juda. O debekwara ndị agha ibu agha doro anya nʼime Jerusalem.
2CH 17:14 Ngụkọta ha dịka e si dekọọ ya nʼezinaụlọ si dị: Ndị si Juda, ndịisi agha na-achị puku ndị agha (1,000), Adna, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha atọ (300,000),
2CH 17:15 onye na-eso ya bụ Jehohanan, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha abụọ na iri puku asatọ (280,000),
2CH 17:16 ọzọ, Amasiya nwa Zikri, onye ji afọ ofufu nye onwe ya maka ọrụ Onyenwe anyị, na-achị narị puku ndị agha abụọ (200,000).
2CH 17:17 Ndị si Benjamin, Eliada, dimkpa nʼagha, na-achị narị puku ndị agha abụọ (200,000), ndị ji akụ na ụta, na ọta ebu agha.
2CH 17:18 Onye ọzọ bụ Jehozabad, onye na-achị narị puku ndị agha na iri puku asatọ (180,000), ndị jikeere ibu agha.
2CH 17:19 Ndị a bụ ndị ikom na-ejere eze ozi, nʼagụnyeghị ndị ahụ o tinyere ka ha nọdụ nʼobodo niile e wusiri ike dị nʼime Juda.
2CH 18:1 Ugbu a, Jehoshafat nwere akụnụba na ugwu buru ibu, bịakwa ghọọ ọgọ Ehab.
2CH 18:2 Mgbe afọ ole na ole gasịrị, Jehoshafat gara Sameria ileta Ehab. Ehab gbuuru ya na ndị ya na ha yi ọtụtụ atụrụ na ehi, ọ kpọrọ oriri kwagide ya ka o buso Ramọt Gilead agha.
2CH 18:3 Ehab eze Izrel jụrụ Jehoshafat eze Juda, sị, “Ị ga-eso m buso Ramọt Gilead agha?” Jehoshafat zaghachiri, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị nke m bụkwa ndị gị. Anyị ga-eso gị gaa agha.”
2CH 18:4 Ma Jehoshafat gwakwara eze Izrel, sị, “Buru ụzọ chọpụta ntụziaka Onyenwe anyị.”
2CH 18:5 Ya mere, eze Izrel kpọkọtara ndị amụma dị narị ndị ikom anọ nʼọnụọgụgụ jụọ ha, sị, “Anyị a ga-ebuso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?” Ha zara, “Gaa, nʼihi na Chineke ga-enyefe ha nʼaka eze.”
2CH 18:6 Ma Jehoshafat jụrụ, “Ọ bụ na e nwekwaghị onye amụma Onyenwe anyị nọ nʼebe a, onye anyị nwere ike ịjụta ase nʼaka ya?”
2CH 18:7 Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ Onyenwe anyị ase, ọ bụ Maikaya nwa Imla, ma akpọrọ m ya asị, nʼihi na o nweghị oge ọ na-ebu amụma ihe ọma nʼebe m nọ, kama ọ bụ naanị nke ọjọọ.” Jehoshafat sịrị, “Eze ekwesighị ikwu okwu dị otu a.”
2CH 18:8 Mgbe ahụ, eze Izrel kpọrọ otu onye na-ejere ya ozi sị ya, “Mee ọsịịsọ kpọta Maikaya nwa Imla nʼebe a.”
2CH 18:9 Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha.
2CH 18:10 Zedekaya nwa Kenaana, mere mpi igwe, ọ kwupụtara sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Ihe ndị a ka ị ga-eji sọgide ndị Aram, ruo mgbe a ga-ala ha nʼiyi.’ ”
2CH 18:11 Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.”
2CH 18:12 Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.”
2CH 18:13 Ma Maikaya sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Chineke m kwuru.”
2CH 18:14 Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?” Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na a ga-enyefe ha nʼaka gị.”
2CH 18:15 Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha Onyenwe anyị?”
2CH 18:16 Mgbe ahụ, Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Ndị a enweghị onyendu, ka onye ọbụla laghachi nʼụlọ ya nʼudo.’ ”
2CH 18:17 Eze Izrel sịrị Jehoshafat, “Ọ bụ na m agwaghị gị na ọ dịghị mgbe ọ na-ebu amụma ihe ọma banyere m, kama naanị ihe ọjọọ?”
2CH 18:18 Maikaya gara nʼihu sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị: Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya.
2CH 18:19 Ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab, eze Izrel, ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’ “Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ.
2CH 18:20 Nʼikpeazụ, otu mmụọ pụtara guzo nʼihu Onyenwe anyị sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’ “Onyenwe anyị jụrụ ya sị, ‘Olee otu ị ga-esi mee nke a?’
2CH 18:21 “Ọ zara, ‘Aga m apụ bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile.’ “Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’
2CH 18:22 “Ma ugbu a, Onyenwe anyị etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. Onyenwe anyị ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.”
2CH 18:23 Mgbe ahụ, Zedekaya nwa Kenaana, gara nso maa Maikaya aka na nti, jụọ ya, “Olee ụzọ ka mmụọ ahụ sitere na Onyenwe anyị gara, mgbe ọ hapụrụ m bịa ịgwa gị okwu?”
2CH 18:24 Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.”
2CH 18:25 Eze Izrel nyere iwu sị, “Jidenụ Maikaya kpụgara ya Amọn, onye na-achị obodo a, na Joash, nwa eze.
2CH 18:26 Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’ ”
2CH 18:27 Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị Onyenwe anyị si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile, hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama.”
2CH 18:28 Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda pụrụ gawa Ramọt Gilead.
2CH 18:29 Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha.
2CH 18:30 Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha, ndị na-agba ụgbọ agha iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.”
2CH 18:31 Mgbe ndị ọchịagha na-achị ụgbọ agha hụrụ Jehoshafat, ha chere nʼobi ha, “Onye a bụ eze Izrel.” Nʼihi ya, ha tụgharịrị ibuso ya agha, ma Jehoshafat tiri mkpu, nke mere na Onyenwe anyị nyeere ya aka. Chineke wezugara ha site nʼebe ọ nọ,
2CH 18:32 nʼihi na mgbe ndị ọchịagha, na-achị ndị na-agba ụgbọ agha hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ha kwụsịrị ịchụso ya.
2CH 18:33 Ma otu onye dọrọ ụta ya gbapụ ya na-ebughị onye ọbụla nʼobi, gbata ya eze Izrel nʼetiti njikọ ihe ikpuchi obi na uwe agha ya. Eze gwara onye ọkwọ ụgbọ agha, sị, “Tụgharịa, si nʼebe a bupụ m nʼihi na emerụọla m ahụ.”
2CH 18:34 Agha ahụ siri ike nʼụbọchị ahụ niile. Eze Izrel guzobere onwe ya ka ọ kwụrụ ọtọ nʼime ụgbọ agha ya na-eche ndị Aram ihu ruo uhuruchi. Ọ nwụrụ mgbe anyanwụ dara.
2CH 19:1 Mgbe Jehoshafat, eze Juda, laghachiri nʼụlọ ya na Jerusalem nʼudo.
2CH 19:2 Jehu nwa Hanani, onye ọhụ ọhụ, pụrụ gaa izute ya; ọ sịrị eze Jehoshafat, “O kwesiri ka i nyere onye ọjọọ aka? Ọ bụkwa ndị na-akpọ Onyenwe anyị asị ka ị na-ahụ nʼanya? Nʼihi nke a iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla gị.
2CH 19:3 Ma otu ọ dị, achọtara ezi ihe nʼime gị, i sitela nʼala a wezuga ogidi Ashera niile, dozieekwa obi gị ịchọ Chineke.”
2CH 19:4 Jehoshafat biri na Jerusalem. Ọ pụrụ gagharịa nʼetiti ndị ya site na Bịasheba ruo nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, laghachikwutekwa Onyenwe anyị, bụ Chineke nke nna nna ha.
2CH 19:5 Ọ họpụtara ndị ikpe nʼala ahụ, nʼotu nʼotu nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nke Juda.
2CH 19:6 Ọ gwara ha si, “Lezienụ anya ihe unu na-eme nʼihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Onyenwe anyị, onye na-anọnyere unu mgbe unu na-ekpebi ikpe.
2CH 19:7 Ugbu a, kwenụ ka egwu Onyenwe anyị dịrị nʼime unu. Kpeenụ ikpe ziri ezi, nʼihi na nʼebe Onyenwe anyị Chineke anyị nọ, ikpe ikpe na-ezighị ezi, maọbụ ile mmadụ anya nʼihu maọbụ iri ngarị adịghị ya.”
2CH 19:8 Ọzọkwa, nʼime Jerusalem, Jehoshafat họpụtara ụfọdụ ndị Livayị, na ndị nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ Izrel ka ha bụrụ ndị na-ahazi iwu nke Onyenwe anyị na-edozikwa esemokwu. Ha bikwa na Jerusalem.
2CH 19:9 O nyere ha iwu ndị a, “Jirinụ ikwesi ntụkwasị obi, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rụọ ọrụ unu.
2CH 19:10 Mgbe ọbụla ụmụnna unu ndị bi nʼobodo unu dị iche iche buteere unu ikpe igbu mmadụ maọbụ ikpe mmebi iwu ọbụla, maọbụ ihe megidere ihe e nyere nʼiwu, maọbụ nke megidere ụkpụrụ, ma ọ bụkwanụ megide iwu na usoro ime ihe, unu ga-adọ ha aka na ntị ka ha ghara imehie megide Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị unu na ụmụnna unu. Ma ọ bụrụ na unu arụọ ọrụ unu nke ọma, unu agaghị emehie.
2CH 19:11 “Amaraya, onyeisi nchụaja, ga-abụ onyeisi unu nʼihe ọbụla metụtara Onyenwe anyị. Zebadaya nwa nwoke Ishmel, onyeisi nke ebo Juda ga-abụ onyeisi unu nʼihe o bụla metụtara eze. Ndị Livayị ga-abụ ndịisi ozi nʼihu unu. Bụrụkwanụ ndị dị ike, unu atụkwala ụjọ, ka Onyenwe anyị nọnyere ndị na-eme nke ọma.”
2CH 20:1 Mgbe oge nta gasịrị, eze ndị Moab na nke ndị Amọn, na ndị ọzọkwa, bịara ibuso Jehoshafat na ndị Juda agha.
2CH 20:2 Ụfọdụ ndị mmadụ bịara gwa Jehoshafat sị, “Lee, igwe usuu ndị agha na-abịa imegide gị site nʼEdọm, nakwa nʼofe osimiri Nnu (osimiri nwụrụ anwụ). Ha erutela Hazezọn Tama, ebe a na-akpọkwa En-Gedi.”
2CH 20:3 Jehoshafat tụrụ egwu nke ukwuu, kpebiekwa ịchọ inyeaka Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, ọ kpọsara obubu ọnụ nye ndị Juda niile.
2CH 20:4 Ndị Juda zukọtara ịchọ inyeaka Onyenwe anyị; nʼezie, ha sitere nʼobodo niile nke Juda bịa ịchọ ihu Onyenwe anyị.
2CH 20:5 Mgbe ahụ, Jehoshafat guzoro nʼetiti nzukọ ndị Juda na Jerusalem nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼihu ogige ọhụrụ ahụ,
2CH 20:6 sị; “O Onyenwe anyị, Chineke nna nna anyị ha, ọ bụghị gị bụ Chineke onye bi nʼeluigwe? Ọ bụkwa gị na-achị alaeze niile nke mba dị iche iche. Ike na ume dị nʼaka gị, ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzogide gị.
2CH 20:7 O Chineke anyị, ọ bụghị gị onwe gị chụpụrụ ndị bi nʼala, site nʼihu ndị gị Izrel, were ya nye ụmụ ụmụ Ebraham, bụ enyi gị nwoke?
2CH 20:8 Ha ebiela nʼime ya wukwaa ebe nsọ nʼime nye nʼAha gị na-asị,
2CH 20:9 ‘Ọ bụrụ na ihe ọjọọ adakwasị anyị, maọbụ mma agha, ma nke ikpe ọmụma, maọbụ ajọọ ọrịa na-efe efe, maọbụ oke ụnwụ, anyị ga-eguzo nʼihu gị nʼụlọnsọ a nke a kpọkwasịrị Aha gị, kpọkuo gị nʼime nsogbu anyị, gị onwe gị ga-aza anyị, zọpụtakwa anyị.’
2CH 20:10 “Ugbu a lee, ndị ikom si Amọn, na Moab, na nʼugwu Sia, ndị ị na-ekweghị ka ndị Izrel banye nʼoke ala ha mgbe ha si nʼIjipt pụta, kama ha sitere nʼakụkụ ọzọ gabiga si otu a chebe ndị a ndụ.
2CH 20:11 Lee ihe ha ji akwụ anyị ụgwọ bụ ịchọ ka ha chụpụ anyị nʼala a i nyere anyị ka ọ bụrụ ihe nketa anyị.
2CH 20:12 O Chineke anyị, ọ bụ na ị gaghị ekpe ha ikpe? Nʼihi na ike adịghị nʼime anyị iguzogide igwe mmadụ ndị a bara ụba na-abịa ịlụso anyị ọgụ. Anyị amakwaghị ihe anyị ga-eme, kama ọ bụ na gị ka anya anyị na-adịkwasị.”
2CH 20:13 Ndị ikom Juda niile, ha na ndị nwunye ha, na ụmụ ha, na ụmụntakịrị ha guzoro nʼihu Onyenwe anyị.
2CH 20:14 Mgbe ahụ, mmụọ Nsọ Onyenwe anyị dakwasịrị Jahaziel nwa Zekaraya, nwa Benaya, nwa Jeiel, nwa Matanaya, bụ onye Livayị, onye si nʼikwu Asaf, dịka o guzo nʼetiti mkpọkọta ahụ.
2CH 20:15 Ọ sịrị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda niile na ndị bi na Jerusalem, na gị eze Jehoshafat. Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-asị unu. ‘Unu atụla ụjọ, maọbụ daa mba, nʼihi usuu ndị agha a niile dị unu nʼihu. Ọ bụghị unu ka agha a dịịrị, kama ọ bụ Chineke nwe ya.
2CH 20:16 Echi pụọnụ izute ha. Ha ga arịgota site nʼụzọ warawara nrigo Ziz, unu ga-ahụ ha na nsọtụ ndagwurugwu dị tupu e ruo nʼọzara Jeruel.
2CH 20:17 Ọ bụghị unu ka ọ dịrị ịlụ agha a, kama werenụ ọnọdụ unu, guzosienụ ike ka unu jiri anya unu hụ nzọpụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-enye unu, unu ndị Juda na Jerusalem. Unu atụla egwu, unu adakwala mba. Pụkwuru ha nʼihu agha mgbe chi echi bọrọ, Onyenwe anyị ga-anọnyekwara unu.’ ”
2CH 20:18 Mgbe ahụ, Jehoshafat, na ndị Juda na ndị Jerusalem niile dara nʼala kelee Onyenwe anyị, kpọọ isiala nye ya.
2CH 20:19 Mgbe ahụ kwa, ndị Livayị si nʼagbụrụ Kohat na Kora jiri ike ha niile too Onyenwe anyị Chineke Izrel nʼabụ.
2CH 20:20 Nʼisi ụtụtụ, ha pụrụ gawa nʼọzara Tekoa. Ma mgbe ha na-apụ, Jehoshafat guzoro ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem. Nweenụ okwukwe nʼime Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nwekwanụ ntụkwasị obi na ige ndị amụma ya ntị, ka ihe gaara unu nke ọma.”
2CH 20:21 Mgbe ya na ndị ya gbasịrị izu, Jehoshafat họpụtara ndị ikom ndị ga-eji abụ too Onyenwe anyị nʼihi ebube ya na ịdị nsọ ya. Mgbe ha na-aga nʼihu ndị agha, ha na-abụ abụ na-asị: “Nyenụ Onyenwe anyị ekele, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo ebighị ebi.”
2CH 20:22 Mgbe ndị Juda malitere ịbụ abụ na ito otuto, Onyenwe anyị cheere ndị agha Amọn na nke ndị Moab, na ndị nke si nʼugwu Sia nʼụzọ, merie ha.
2CH 20:23 Ma ndị agha Amọn na Moab buru ụzọ lụso ndị agha si nʼugwu Sia ọgụ. Mgbe ha lakwara onwe ha nʼiyi, ọgụ dakwara nʼetiti ndị Moab na Amọn.
2CH 20:24 Mgbe ndị agha Juda rutere ebe ha ga-esi lepụ anya hụ ihe na-eme nʼọzara ahụ, ha lepụrụ anya ịhụ usuu ndị agha ahụ, ma ihe ha hụrụ bụ ozu ndị agha tọgbọcha nʼala. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị agha ahụ gbapụrụ na ndụ.
2CH 20:25 Ya mere Jehoshafat na ndị agha ya banyere nʼọgbọ agha ahụ kwakọrọ ihe nkwata nʼagha. Ha butere ọtụtụ ngwa agha, na uwe na ihe ndị ọzọ dị oke ọnụahịa ma ha enweghị ike ibutecha ihe niile. Ihe nkwata nʼagha hiri nne ruo na o were ha ụbọchị atọ ibutecha ha.
2CH 20:26 Nʼụbọchị nke anọ ha zukọtara na Ndagwurugwu Beraka ebe ha nọ too Onyenwe anyị otuto. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Beraka ruo taa.
2CH 20:27 Emesịa, Jehoshafat duuru ndị Juda na Jerusalem niile laghachi na Jerusalem nʼọṅụ, nʼihi na Onyenwe anyị emeelara ha ihe ha kwesiri iji ṅụrịa ọṅụ nʼebe ndị iro ha nọ.
2CH 20:28 Ha ji une, na ụbọ akwara, na opi ike bata Jerusalem, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
2CH 20:29 Egwu Chineke dakwasịrị alaeze niile bi gburugburu, mgbe ha nụrụ otu Onyenwe anyị si lụọ ọgụ megide ndị iro Izrel niile.
2CH 20:30 Ya mere, udo dịrị nʼalaeze Jehoshafat, nʼihi na Chineke nyere ya udo.
2CH 20:31 Jehoshafat ghọrọ eze juda. Ọ gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze Juda. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi.
2CH 20:32 O jere ije nʼụzọ niile nke Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
2CH 20:33 Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ ka nọ na-ejighị obi ha niile tụkwasị na Chineke nke nna nna ha.
2CH 20:34 Ihe banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼọchịchị Jehoshafat, site na mbido ruo na ngwụcha, ka e dere nʼakwụkwọ ihe mere nke Jehu nwa Hanani, nke e debanyere nʼime akwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel.
2CH 20:35 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jehoshafat, bụ eze Juda jikọrọ onwe ha na Ahazaya, eze Izrel, onye ahụ omume ya jọrọ njọ.
2CH 20:36 Ha kwekọrịtara ka ha na ya wuo ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa. Emesịa, ha wuru ụgbọ ndị a nʼEziọn Geba.
2CH 20:37 Elieza nwa Dodavahu, onye Maresha buru amụma megide Jehoshafat, na-asị, “Nʼihi na i kwenyere ka gị na Ahazaya na-azụkọ ahịa, Onyenwe anyị ga-emebi ihe ndị a ị rụrụ.” Ụgbọ mmiri ahụ niile kpuru, ha enwekwaghị ike ijeru Tashish zụọ ahịa.
2CH 21:1 Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2CH 21:2 Ụmụnne Jehoram, ndị bụkwa ụmụ Jehoshafat bụ ndị a: Azaraya, Jehiel, Zekaraya, Azarayu, Maikel na Shefataya. Ndị a niile bụ ụmụ Jehoshafat, bụ eze Izrel.
2CH 21:3 Nna ha nyere onye ọbụla nʼime ha ọtụtụ onyinye nke ọlaọcha, na ọlaedo, na ihe ndị dị oke ọnụahịa, tinyere obodo e wusiri ike nʼime Juda. Ma o mere Jehoram eze, nʼihi na ọ bu ọkpara ya.
2CH 21:4 Mgbe Jehoram mere onwe ya ka o guzosie ike nʼebe alaeze nna ya dị, o weere mma agha gbuo ụmụnne ya ndị ikom niile, tinyere ụfọdụ nʼime ndịisi Izrel.
2CH 21:5 Jehoram gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ asatọ na Jerusalem.
2CH 21:6 O soro ụzọ ndị eze Izrel, dịka ụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ ada Ehab. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
2CH 21:7 Ma nʼagbanyeghị nke a, Onyenwe anyị achọghị ibibi ụlọ Devid, nʼihi ọgbụgba ndụ ahụ Onyenwe anyị na Devid nwere. Nʼihi na o kwere ya nkwa ime ka oriọna dịịrị ya na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
2CH 21:8 Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze.
2CH 21:9 Ya mere, Jehoram duuru ndịisi agha ya na ụgbọ agha ya niile gaa nʼebe ahụ. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu.
2CH 21:10 Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa. Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ, nʼihi na Jehoram gbakụtara Onyenwe anyị Chineke nna nna ya ha azụ.
2CH 21:11 O wukwara ọtụtụ ebe dị elu nʼọtụtụ ugwu nke Juda, mee ka ndị bi na Jerusalem were onwe ha nye ife arụsị. O si otu a duhiekwa Juda.
2CH 21:12 Jehoram natara akwụkwọ ozi site nʼaka Ịlaịja onye amụma, nke sịrị: “Otu a ka Onyenwe anyị Chineke nke nna gị Devid, kwuru, ‘Nʼihi na i soghị ụzọ niile nke nna gị, bụ Jehoshafat, maọbụ nke Asa bụ eze Juda,
2CH 21:13 kama ị sooro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, meekwa ka ndị Juda na ndị Jerusalem fee chi ọzọ, dịka ụlọ Ehab mere. Ị gbuola ụmụnne nke gị, ndị bụ ndị si nʼezinaụlọ nke gị onwe gị, ndị ikom bụ ndị dị mma karịa gị.
2CH 21:14 Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị ga-eji ihe otiti nke ọrịa tie ndị gị, ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye gị, na ihe niile i nwere.
2CH 21:15 Gị onwe gị kwa ga-ada nʼoke ọrịa, ọrịa afọ nke na-agaghị ekwe ngwọta. Ọrịa a ga-eme ka eriri afọ gị na-enupụta kwa ụbọchị.’ ”
2CH 21:16 Onyenwe anyị mekwara ka ndị Filistia, na ndị Arab, ndị bi nso ndị Kush, bịa lụso Jehoram agha.
2CH 21:17 Ha ji ike bata Juda, buru ihe niile dị mma ha hụrụ nʼụlọeze, tinyere ụmụ nwoke ya niile na ndị nwunye ya niile. Ọ bụ naanị Ahazaya, nwa ya nwoke nke nta ka ha hapụrụ.
2CH 21:18 Ọ bụ mgbe nke a gasịrị ka Onyenwe anyị mere ka ọrịa afọ nke a na-apụghị ịgwọta agwọta bịakwasị Jehoram.
2CH 21:19 Mgbe afọ abụọ gasịrị, eriri afọ ya nupụtara nʼihi ọrịa ahụ. Ọ nwụkwara nʼoke ihe mgbu. Mgbe e liri ya, e meghị omenaala ịkwanye ọkụ olili dịka a na-eme nʼoge a na-eli ndị eze.
2CH 21:20 Ọ gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze Jerusalem. Ọ chịrị afọ asatọ nwụọ. Ọnwụ ya abụghị ihe mwute nye onye ọbụla. E liri ya nʼobodo Devid ma ọ bụghị nʼime ili a na-eli ndị eze.
2CH 22:1 Ndị Jerusalem mere Ahazaya, nwa Jehoram nke nta, eze nʼọnọdụ ya, nʼihi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike, bụ ndị ha na ndị Arab so bata nʼụlọ ikwu ha, egbuolarị ụmụnne ya ndị okenye. Ya mere Ahazaya, nwa Jehoram bụ eze Juda malitere ịchị.
2CH 22:2 Ahazaya gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị otu afọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Atalaya nwa nwa Omri eze Izrel.
2CH 22:3 Ya onwe ya sokwara ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, nʼihi na nne ya gbara ya ume ime ajọ omume.
2CH 22:4 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere nʼihi na ha ghọrọ ndị ndụmọdụ ya mgbe nna ya nwụsịrị, nke a wetara ọdịda ya.
2CH 22:5 O gbasokwara ndụmọdụ ha, mgbe o sooro Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ịga buso Hazael eze Aram agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ,
2CH 22:6 ya mere, ọ lọghachitere na Jezril ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ha merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ. Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram, eze Juda gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.
2CH 22:7 Ọ bụ site na nleta Ahazaya gara leta Joram, ka Chineke si weta ọdịda Ahazaya. Mgbe Ahazaya bịarutere, ya na Joram pụrụ ịga zute Jehu nwa Nimshi, onye ahụ Onyenwe anyị tere mmanụ ka ọ laa ezinaụlọ Ehab nʼiyi.
2CH 22:8 Mgbe Jehu nọ na-emezu ihe e kpebiri nʼikpe banyere ezinaụlọ Ehab, o zutere ndị ozi Juda na ụmụ ndị ikom ụmụnne Ahazaya, ndị na-ejere Ahazaya ozi, gbuo ha niile.
2CH 22:9 Ọ pụrụ ịchọ Ahazaya. Ndị ozi ya jidere ya ebe o zoro onwe ya na Sameria. Ha kpụtaara ya Jehu onye gburu ya. Ha liri ya, nʼihi na ha kwuru sị, “Nwa Jehoshafat ka ọ bụ, onye jiri obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị.” Ya mere, o nwekwaghị onye dị ike nʼụlọ Ahazaya ijide alaeze ahụ.
2CH 22:10 Mgbe Atalaya, nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze, bụ ndị ezinaụlọ eze Juda.
2CH 22:11 Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, kuuru Joash nwa Ahazaya zopu ya site nʼetiti ụmụ eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina. Nʼihi na Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, bụ nwanne Ahazaya, ma bụrụkwa nwunye Jehoiada onye nchụaja, ya mere o jiri zonarị Atalaya nwantakịrị ahụ, ka ọ ghara igbu ya.
2CH 22:12 Ya na ha nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Chineke, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ.
2CH 23:1 Nʼafọ nke asaa, Jehoiada gosiri ịdị ike nke obi ya. Ya na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha gbara ndụ. Ndị a bụ: Azaraya nwa Jeroham, Ishmel nwa Jehohanan, Azaraya nwa Obed, Maaseia nwa Adaya na Elishafat nwa Zikri.
2CH 23:2 Ha pụrụ gaa akụkụ niile nke ala Juda kpọkọta ndị Livayị na ndịisi ezinaụlọ Izrel site nʼobodo niile. Mgbe ha bịarutere Jerusalem,
2CH 23:3 ọgbakọ ahụ niile na eze gbara ndụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Mgbe ahụ, Jehoiada sịrị ha, “Nwa eze ga-achị dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa banyere agbụrụ Devid.
2CH 23:4 Ugbu a, nke a bụ ihe unu ga-eme: Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị nchụaja na ndị Livayị, bụ ndị ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike ga-abụ ndị ga-eche ọnụ ụzọ niile nche.
2CH 23:5 Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ọzọ ga-anọ nʼụlọeze, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Ntọala. Ndị ọzọ niile ga-anọ gburugburu mpụta ụlọnsọ Onyenwe anyị.
2CH 23:6 Ọ dịghị onye ọbụla ga-abata nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị karịa naanị ndị nchụaja na ndị Livayị ndị nọ ọrụ, ha ga-abata nʼihi ha bụ ndị edoro nsọ, ma ndị ọzọ niile ga-edebe iwu Onyenwe anyị, ghara ịbata.
2CH 23:7 Ndị Livayị ga-edo onwe ha gburugburu eze, onye ọbụla ga e jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla batara nʼime ụlọnsọ ahụ ka a ga-egbu. Nọrọnụ eze nso, ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.”
2CH 23:8 Ndị Livayị na ndị ikom Juda niile mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike ma ndị na-emechi ọrụ. Nʼihi na Jehoiada onye nchụaja ezipụghị otu ọbụla nʼime ndị ọrụ ahụ niile.
2CH 23:9 O nyere ndị ọchịagha ahụ na-elekọta narị ndị agha, ùbe na ọta ukwu na ọta nta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, bụ ndị dị nʼụlọnsọ Chineke.
2CH 23:10 O guzobere ndị ikom niile ahụ, onye ọbụla ji ngwa agha ya nʼaka ya, nọdụ eze gburugburu na nso ebe ịchụ aja na ụlọnsọ ukwu ahụ. Site nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ.
2CH 23:11 Jehoiada na ụmụ ya ndị ikom kpọpụtara nwa eze, kpube ya okpueze nʼisi, ha nyere ya otu akwụkwọ nke ihe ọgbụgba ndụ ahụ, chie ya eze. Ha tekwara ya mmanụ ịbụ eze, tie mkpu sị, “Ka eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!”
2CH 23:12 Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ ndị mmadụ, ndị na-agba ọsọ na-eto eze, ọ gakwuru ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2CH 23:13 O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi ya dị na mbata. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze, ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Ndị ọbụ abụ jikwa iti egwu na-edu nʼabụ otuto. Mgbe ahụ, Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nke a bụ nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!”
2CH 23:14 Jehoiada, bụ onye nchụaja zipụrụ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, sị ha, “Sitenụ nʼetiti ahịrị ahụ kpụpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Ka egbula ya na ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.”
2CH 23:15 Ya mere, ha jidere ya mgbe o rutere na mbata nke ọnụ ụzọ ịnyịnya nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha gburu ya.
2CH 23:16 Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị, na ya, na ndị mmadụ, na eze, ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị.
2CH 23:17 Ndị niile ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ.
2CH 23:18 Mgbe ahụ, Jehoiada nyefere nlekọta nke ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị nʼaka ndị nchụaja bụ ndị Livayị, bụ ndị Devid nyere ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ nke Onyenwe anyị nʼime ụlọnsọ, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, nʼiji ọṅụ na ịbụ abụ dịka Devid nyere nʼiwu.
2CH 23:19 O debekwara ndị nche nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, igbochi ka onye ọbụla nke na-adịghị ọcha nʼụzọ ọbụla ghara ịbanye.
2CH 23:20 Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, na ndị a na-asọpụrụ, na ndị na-achị achị, na ndị ala ahụ niile, dupụta eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha bara nʼụlọeze site nʼọnụ ụzọ ama nke dị Elu, mee ka eze nọkwasị nʼelu ocheeze.
2CH 23:21 Ndị ala ahụ niile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, obodo ahụ dakwara jụụ, nʼihi na e ji mma agha gbuo Atalaya nʼụlọeze.
2CH 24:1 Joash gbara afọ asaa mgbe e mere ya eze, ọ chịrị iri afọ anọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zibịa onye Bịasheba.
2CH 24:2 Joash mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị nʼafọ niile nke Jehoiada bụ onye nchụaja, dị ndụ.
2CH 24:3 Jehoiada lụtaara ya ndị inyom abụọ, ndị mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
2CH 24:4 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Joash kpebiri ime ka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị ọhụrụ.
2CH 24:5 Ọ kpọkọtara ndị nchụaja na ndị Livayị niile sị ha, “Gaanụ nʼobodo Juda niile nakọta ego ụtụ afọ nʼaka ndị Izrel niile, maka iwuzi ụlọnsọ Chineke unu. Meenụ ya ugbu a.” Ma ndị Livayị emeghị ya ngwangwa.
2CH 24:6 Ya mere, eze kpọrọ Jehoiada bụ onyeisi nchụaja sị ya, “Gịnị mere i mebeghị ka ndị Livayị gaa nakọtaa, site nʼaka ndị bi nʼobodo Juda niile, na nʼobodo Jerusalem, ego ụtụ nke Mosis ohu Onyenwe anyị na ọgbakọ ụmụ Izrel nyere nʼiwu maka ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ?”
2CH 24:7 Nʼoge a ụmụ ndị ikom Atalaya, nwanyị ọjọọ ahụ tipuru ụlọnsọ Chineke, bukọrọ ihe nsọ niile e ji efe Onyenwe anyị dị nʼime ya maka Baal.
2CH 24:8 Ya mere, eze nyere iwu ka e wuo igbe onyinye, nke a ga-adọba nʼọnụ ụzọ e si abanye ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2CH 24:9 A kpọsara ya na Juda na Jerusalem niile sị ka ha wetara Onyenwe anyị ụtụ nke Mosis ohu Chineke kwagidere ụmụ Izrel nʼọzara na ha ga na-atụ.
2CH 24:10 Ndịisi na ndị mmadụ niile jiri obi ụtọ tụta ụtụ ha. Ha jiri onyinye ha bịa tụnye ha nʼigbe onyinye ahụ, tutu rụọ mgbe o juru nʼọnụ.
2CH 24:11 Mgbe ọbụla ndị Livayị bubataara ndị ozi eze igbe ahụ, ha hụ na-atụjuola ya ego, ode akwụkwọ eze ya na onyeozi nke onyeisi nchụaja ga-awụpụta ihe dị nʼigbe, ma bughachi okpokoro igbe ahụ nʼọnọdụ ya. Otu a ka ha mere ọtụtụ oge ruo mgbe ha nwetara ọtụtụ ego dị ukwuu.
2CH 24:12 Eze na Jehoiada weere ego ahụ niile nyefee ha nʼaka ndị ọrụ ụlọ Onyenwe anyị dị nʼaka, ha chọtara ndị ọka na-edo nkume, na ndị ọkpọ ǹtu. Ha tinyere ọrụ ime ka ụlọnsọ ahụ dị ọhụrụ nʼaka ndị a. Ha gokwara ndị ụzụ bịara kpụọ ihe niile gbasara bronz na igwe e ji rụọ ọrụ ahụ.
2CH 24:13 Ndị e nyefere ọrụ ahụ nʼaka ji obi ha niile rụọ ọrụ nke mere na ọrụ ahụ gara nʼihu nke ọma. Ha rụziri ụlọnsọ ukwu Chineke dịka atụmatụ ya mbụ si dị, meekwa ya ka o sie ike karịa.
2CH 24:14 Mgbe ha rụsịrị ọrụ niile, ha weghachitere ego fọdụrụ, nye ya eze na Jehoiada, ha were ya rụta ngwa ije ozi maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, ngwa ije ozi na ihe isure aja nsure ọkụ, na ngaji, ya na efere dị iche iche, na ihe ọlaọcha na ọlaedo. A na-achụ aja nsure ọkụ nʼụlọnsọ nye Onyenwe anyị ụbọchị niile Jehoiada dị ndụ.
2CH 24:15 Ma Jehoiada mere nnọọ agadi, jupụtakwa nʼọtụtụ afọ, ọ nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri afọ atọ.
2CH 24:16 E liri ya nʼebe a na-eli ndị eze nʼobodo Devid nʼihi ihe ọma niile o meere Izrel na Chineke na ụlọnsọ ya.
2CH 24:17 Mgbe Jehoiada nwụsịrị, ndịisi Juda bịara ịkwanyere eze Joash ugwu. O gekwara ha ntị.
2CH 24:18 Ha hapụrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna ha, fee ogidi Ashera na arụsị ndị ọzọ. Nʼihi ikpe ọmụma ha wetaara onwe ha, iwe Chineke dakwasịrị Juda na Jerusalem.
2CH 24:19 Onyenwe anyị zitere ọtụtụ ndị amụma, ndị bịara buo amụma maka ịkpọghachi ha azụ, ma ha mesiri obi ha ike, jụ ige ntị.
2CH 24:20 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị Zekaraya nwa Jehoiada onye nchụaja. O guzoro nʼihu ọha na eze gwa ha okwu sị; “Otu a ka Chineke sịrị, ‘Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị? Ihe agaghị agara unu nke ọma. Unu agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ugbu a, ya onwe ya agbakụtakwala unu azụ.’ ”
2CH 24:21 Ma ndịisi Juda niile gbara izu megide ya, sitekwa nʼiwu eze nyere ha ji nkume tugbuo ya nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2CH 24:22 Eze Joash echetaghị ebere nke nna Zekaraya bụ Jehoiada meere ya kama o gburu nwa ya. Ma mgbe ọ na-anwụ, ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị hụkwa mmeso ọjọọ a ma kwụọkwa unu ụgwọ ajọ omume unu niile.”
2CH 24:23 O ruo ka ọ gbara otu afọ, ndị agha Aram bịara imegide Joash, ha wakporo Juda na Jerusalem gbuo ndị ndu niile site nʼetiti ndị mmadụ. Ha zigaara eze ha nọ na Damaskọs ihe niile ha kwatara nʼike.
2CH 24:24 Nʼagbanyeghị na ndị Aram kpọọ naanị ndị ikom ole na ole bịa, Onyenwe anyị raara igwe ndị agha dị ukwuu ranye ha nʼaka. Nʼihi na Juda gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke nke nna nna ha, e mezuru ihe niile e kpere nʼikpe nʼahụ Joash.
2CH 24:25 Mgbe ndị agha Aram lara, hapụ Joash nʼọnọdụ mmerụ ahụ dị ukwuu, ndịisi ozi ya gbara izu gbuo ya, nʼihi ogbugbu o gburu nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ha gburu ya mgbe o dina nʼihe ndina ya. Emesịa, ha liri ya nʼobodo Devid, ma ọ bụghị nʼebe a na-eli ndị eze.
2CH 24:26 Ndị gbara izu gbuo ya bụ Zabad, onye nne ya bụ Shimeat onye Amọn, na Jehozabad, onye nne ya bụ Shimrit onye Moab.
2CH 24:27 Ihe niile gbasara Joash na ụmụ ya, na amụma niile e buru banyere ya, na otu e si wuzie ụlọnsọ ukwu Chineke, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel niile. Mgbe Joash nwụrụ, Amazaya nwa ya ghọrọ eze Juda.
2CH 25:1 Amazaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe e mere ya eze, ọ chịrị dịka eze iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Nne ya bụ Jehoadin onye Jerusalem.
2CH 25:2 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ma o jighị obi ya niile mee nke a.
2CH 25:3 Mgbe alaeze guzosiri ike nʼokpuru ọchịchị ya, o gburu ndị ozi ahụ gburu eze, bụ nna ya.
2CH 25:4 Ma o meghị ka ụmụ ha nwụọ, kama ọ gbasoro usoro ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis, ebe Onyenwe anyị nyere iwu sị: “Ndị mụrụ ụmụ agaghị anwụ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.”
2CH 25:5 Amazaya kpọkọtara ndị Juda, guzo ha dịka ezinaụlọ ha si dị, kenye ha nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndị na-achị ọtụtụ narị ndị agha, bụ ndị Juda na ndị Benjamin niile. Mgbe ọ gụrụ ndị dị afọ iri abụọ maọbụ karịa ọnụ, ọ chọpụtara na ha dị narị puku ndị ikom atọ ndị tozuru iji ùbe na ọta buo agha.
2CH 25:6 O ji narị talenti ọlaọcha gota narị puku ndị agha site nʼala Izrel.
2CH 25:7 Ma otu onye nke Chineke bịakwutere ya, sị ya; “Eze, ka ndị agha a si Izrel ghara isonyere gị, nʼihi na Onyenwe anyị anọnyereghị ndị Izrel, ọ nọnyereghị onye ọbụla sitere nʼIfrem.
2CH 25:8 A sịkwarị na i jiri obi dimkpa ga agha a, Chineke ga-eme ka ndị iro gị merie gị, nʼihi na Chineke bụ onye nwere ike inyere mmadụ aka maọbụ ime ka ọ sụọ ngọngọ.”
2CH 25:9 Amazaya sịrị onye nke Chineke ahụ, “Gịnị kwanụ ka anyị ga-eme banyere narị ego talenti m kwụrụ maka ndị agha Izrel?” Onye nke Chineke ahụ zara, “Onyenwe anyị pụrụ inye gị karịa nke ahụ.”
2CH 25:10 Amazaya zighachiri ndị agha Izrel ahụ azụ ka ha laa, bụ ndị a si nʼIfrem bịakwute ya. Ha were iwe nke ukwuu megide Juda, jirikwa oke iwe laghachi nʼụlọ ha.
2CH 25:11 Amazaya duuru ndị agha ya gaa na Ndagwurugwu Nnu, ebe o gburu ndị ikom Sia dị puku iri.
2CH 25:12 Ndị agha Juda nwudoro puku ndị ikom iri ọzọ na ndụ, duru ha gaa nʼelu nkume dị elu, si nʼebe ahụ tụda ha niile, nke mere na ha niile kụpịasịrị.
2CH 25:13 Ma ndị agha ahụ Amazaya zilagara, ka ha ghara iso ya gaa agha, wakporo ọtụtụ obodo ndị Juda site na Sameria ruo Bet-Horon. Ha gburu puku mmadụ atọ nʼime ha, bukọrọkwa ọtụtụ ihe nkwata nʼagha, buru ha laa.
2CH 25:14 Mgbe Amazaya sitere nʼagha ebe o gburu ọtụtụ ndị Edọm lọta, o bulatara chi nke ndị Sia. O guzobere ha dịka chi ndị nke aka ya, kpọọ isiala nye ha ma surekwa aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ha.
2CH 25:15 Iwe Onyenwe anyị dị ukwuu megide Amazaya. O zigaara ya onye amụma, onye sịrị, “Nʼihi gịnị ka iji ajụ ase site nʼaka chi nke ndị ahụ, bụ ndị na-enweghị ike ịzọpụta ndị ha site nʼaka gị?”
2CH 25:16 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ ya, eze sịrị ya; “Mechie ọnụ! Ị chọrọ ịnwụ? Ole mgbe ka anyị mere gị onye na-adụ eze ọdụ?” Ya mere, onye amụma ahụ kwụsịrị, ma sị, “Amaara m na Chineke ekpebiela ịla gị nʼiyi, nʼihi na i mere nke a ma jụkwa ige ntị na ndụmọdụ m.”
2CH 25:17 Emesịa, mgbe Amazaya, eze Juda gbachara izu ya na ndị ndụmọdụ ya, o zigara Jehoash nwa Jehoahaz, nwa Jehu, eze Izrel ozi ịma aka, sị, “Bịa ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.”
2CH 25:18 Ma Jehoash eze Izrel, zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda, sị; “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ zọpịa uke ahụ.
2CH 25:19 Ị na-asị onwe gị, na i meriela Edọm, ugbu a, mpako abatala, isi a na-ebu gị. Ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?”
2CH 25:20 Ma Amazaya egeghị ntị, nʼihi na Chineke na-akwado inyefe ya nʼaka Jehoash onye iro ha, nʼihi na ha chọrọ chi ndị Edọm gawa.
2CH 25:21 Ya mere, Jehoash bụ eze Izrel buliri agha. Ya na Amazaya eze Juda zutere ihu na ihu nʼagha na Bet-Shemesh, dị nʼala Juda.
2CH 25:22 Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya.
2CH 25:23 Jehoash, bụ eze Izrel nwudere Amazaya eze Juda, nwa Joash, nwa Ahazaya na Bet-Shemesh. Mgbe ahụ, Jehoash duuru ya bịa na Jerusalem, kwada mgbidi Jerusalem, site nʼỌnụ ụzọ ama Ifrem ruo nʼọnụ ụzọ ama Nkuku, nke ogologo ya ruru narị nzọ ụkwụ isii.
2CH 25:24 Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu Chineke, nke e tinyere nʼaka Obed-Edọm ilekọta, tinyekwara akụ niile dị nʼụlọeze. Ọ dọọrọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria.
2CH 25:25 Amazaya nwa Joash, eze Juda nọrọ ndụ afọ iri na ise, mgbe Jehoash nwa Jehoahaz, eze Izrel nwụsịrị.
2CH 25:26 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amazaya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda na Izrel?
2CH 25:27 Site nʼoge Amazaya gbakụtara Onyenwe anyị azụ, ha gbara izuzu imegide ya nʼime Jerusalem. Ọ gbapụrụ gbalaga Lakish, ma ha zipụrụ ndị ikom chụụrụ ya gaa Lakish, gbuo ya nʼebe ahụ.
2CH 25:28 Ha bulatara ozu ya nʼelu ịnyịnya, e lie ya nʼebe e liri nna nna ya ha nʼobodo Juda.
2CH 26:1 Mgbe ahụ, ndị Juda mere Ụzaya eze nʼọnọdụ Amazaya nna ya, mgbe ọ dị naanị afọ iri na isii.
2CH 26:2 Ọ bụ Ụzaya wugharịrị obodo Elat, nwetaghachi ya nye Juda mgbe eze bụ Amazaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ.
2CH 26:3 Ụzaya dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị dịka eze. Ọ chịrị iri afọ ise na abụọ na Jerusalem.
2CH 26:4 O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya mee ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
2CH 26:5 Ụzaya chọsịrị Chineke ike ụbọchị niile nke Zekaraya na-adị ndụ, bụ onye mere ka ọ ghọta ịtụ egwu Chineke. Mgbe niile, dịka ọ na-achọ Onyenwe anyị, Chineke nyere ya ọganihu.
2CH 26:6 O busoro ndị Filistia agha, ma kụdakwa mgbidi niile nke Gat, Jabna, na Ashdọd. Emesịa, o wuziri ọtụtụ obodo dị nʼakụkụ Ashdọd na nʼebe ndị ọzọ nʼobodo Filistia.
2CH 26:7 Chineke nọnyeere ya nʼọgụ niile ọ lụsoro ndị Filistia, na ndị Arab bi na Gua Baal na ndị Meunim.
2CH 26:8 Ndị Amọn na-atụtara ya ụtụ afọ niile, ude aha ya ruru ọ bụladị ala Ijipt nʼihi na ọ ghọrọ onye dị ike nke ukwuu.
2CH 26:9 O wuru ọtụtụ ụlọ elu nche na Jerusalem na nkuku Ọnụ Ụzọ Ama, nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndagwurugwu, na nkuku mgbidi, wusie ha ike.
2CH 26:10 O wukwara ọtụtụ ụlọ elu nche siri ike nʼọzara, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri nʼihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ na ndagwurugwu, na nʼala dị larịị. Ọ hụrụ ịrụ ọrụ ubi nʼanya, nʼihi ya, o nwere ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ nʼubi na ubi vaịnị ya dị nʼala ugwu ugwu, na nʼala ndị dị na ndagwurugwu.
2CH 26:11 Ụzaya nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị ukwuu, ndị a zụziri azụzi, na ndị nọ na njikere mgbe niile ịpụ ibu agha dịka ọnụọgụgụ e kewapụtara ha si dị. Ọ bụ Jeiel, ode akwụkwọ na Maaseia, onyeisi ozi nọ nʼokpuru Hananaya, otu nʼime ndịisi ozi eze, ka ọ dị nʼaka ịgụpụta ndị agha ga-apụ ibu agha.
2CH 26:12 Ndị agha a nwekwara puku ndịisi agha abụọ na narị isii, ya bụ 2,600.
2CH 26:13 Ọnụọgụgụ ndị agha ahụ niile dị narị puku atọ na asaa, na narị ise, ya bụ, 307,500. Ha bụ ndị a zụziri nke ọma, ndị dị nnọọ ike iguzo nʼazụ eze ibu agha megide ndị iro ya.
2CH 26:14 Ụzaya nyere ndị agha niile, ọta, na ùbe, na uwe agha, na okpu igwe, na uwe agha igwe, ụta na nkume na-akwọ mụrụmụrụ, nke ndị na-atụ iche ji alụ ọgụ.
2CH 26:15 O mepụtakwara ihe nchepụta ọhụrụ na Jerusalem, nke ndị nwere amamihe chepụtara, bụ nke a ga-eguzobe nʼụlọ elu nche nakwa nʼelu nkuku mgbidi, ka ndị agha nwee ike jiri ha gbaa àkụ maọbụ tụọ nkume ukwu site nʼelu mgbidi ahụ niile. Ude aha ya gbasara ruo ebe dị anya, nʼihi na-enyeere ya aka nʼụzọ dị ukwuu ruo mgbe ọ ghọrọ onye dị ike.
2CH 26:16 Ma mgbe Ụzaya ghọrọ onye dị ike, nganga wetaara ya ọdịda. Ọ bụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ Chineke ya, ọ banyere nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ chụọ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja.
2CH 26:17 Azaraya onye nchụaja na ndị nchụaja Onyenwe anyị iri asatọ ọzọ bụ dimkpa jekwuru ya nʼebe ahụ.
2CH 26:18 Ha guzogidere eze bụ Ụzaya, sị ya, “Ụzaya, i kwesighị ịbata nʼebe a jiri aka gị suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nke a bụ ọrụ dịrị naanị ndị nchụaja ndị bụ ụmụ Erọn, ndị a họpụtara doo iche maka ọrụ a. Site nʼebe nsọ a pụọ, nʼihi na i gosila onwe gị dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Ọzọ ị gaghị enwekwa nsọpụrụ site nʼaka Onyenwe anyị Chineke gị.”
2CH 26:19 Ụzaya onye ji ihe ịgụ ọkụ nke e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ ahụ nʼaka, were iwe nke ukwu megide ndị nchụaja ahụ. Mgbe ọ nọ na-abara ndị nchụaja mba nʼihu ebe ịchụ aja nke dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, lee ekpenta pụtara ya nʼegedege ihu.
2CH 26:20 Mgbe Azaraya onyeisi nchụaja, na ndị nchụaja ọzọ niile lere ya anya, ha hụrụ na ekpenta agbaala ya nʼegedege ihu ya, ha mere ka ọ site nʼebe ahụ pụọ ngwangwa. Ya onwe ya kwa chọkwara isite nʼebe ahụ pụọ ngwangwa, nʼihi na Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti.
2CH 26:21 Eze Ụzaya bụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche, ebe ọ bụ onye ekpenta, na onye amapụrụ site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Jotam nwa ya ghọrọ onye nlekọta ụlọeze, na-achịkwa ndị ala ahụ.
2CH 26:22 Ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ụzaya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, onye amụma Aịzaya nwa Emọz deturu ha nʼakwụkwọ.
2CH 26:23 Ụzaya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼọhịa ebe a na-eli ozu nke dịịrị ndị eze, maka na ndị mmadụ sịrị, “Ọ bụ onye ekpenta.” Jotam nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2CH 27:1 Jotam gbara iri afọ abụọ na ise mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem. Nne ya bụ Jerusha nwa Zadọk.
2CH 27:2 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Ụzaya mere, ma o meghị dịka nna ya, ọ banyeghị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma ndị mmadụ gara nʼihu na-eme omume ha rụrụ arụ.
2CH 27:3 Jotam wugharịrị Ọnụ Ụzọ Ama nke dị Elu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ nʼelu mgbidi nke ugwu Ofel.
2CH 27:4 O wuru ọtụtụ obodo nʼala ugwu ugwu Juda, wuokwa ọtụtụ ebe e wusiri ike na ụlọ elu nche nʼoke ọhịa.
2CH 27:5 Jotam busoro eze ndị Amọn agha, meriekwa ha. Nʼafọ ahụ, ndị Amọn bunyere ya narị talenti ọlaọcha, na bushel ọka iri puku na puku abụọ, na bushel ọka balị iri puku na puku abụọ.
2CH 27:6 Jotam ghọrọ eze dị ike nʼihi na ọ kpachara anya debe iwu Onyenwe anyị Chineke ya.
2CH 27:7 Ihe ndị ọzọ niile nʼoge ọchịchị Jotam, tinyere ihe gbasara agha niile ọ lụrụ, na ihe ndị ọzọ niile nke o mere, e deturu ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda.
2CH 27:8 Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem.
2CH 27:9 Jotam sooro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Ehaz nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2CH 28:1 Ehaz gbara iri afọ abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara afọ iri na isii nʼime Jerusalem, ma o meghị ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna ya Devid mere.
2CH 28:2 Ọ gbasoro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, kpụọkwa arụsị dị iche iche maka ofufe arụsị Baal.
2CH 28:3 O surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị iche iche nʼime Ndagwurugwu nke Ben Hinom, surekwaa ụmụ ya nʼọkụ. Ọ gbasoro omenaala niile rụrụ arụ nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼihu ndị Izrel.
2CH 28:4 Ọ chụrụ aja surekwaa ihe nsure ọkụ aja na-esi isi ụtọ nʼebe niile dị elu, nʼelu ugwu niile, na nʼokpuru osisi ndụ ọbụla.
2CH 28:5 Nʼihi ya, Onyenwe anyị Chineke ya nyefere ya nʼaka eze ndị Aram. Ndị Aram lụgburu ya, kpọrọ ọtụtụ nʼetiti ndị ya dịka ndị mkpọrọ kpọta ha nʼDamaskọs. E nyefekwara ya nʼaka eze Izrel, onye gburu ọtụtụ ndị agha ya.
2CH 28:6 Nʼotu ụbọchị, Peka nwa Remalaya gburu narị puku ndị agha Juda na iri puku abụọ. Ihe ndị a mere nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị Chineke nna nna ha azụ.
2CH 28:7 Zikri onye Ifrem, onye bụ dike nʼagha, gburu Maaseia, nwa eze, na Azrikam onye na-elekọta ụlọeze. O gbukwara Elkena onye na-esota eze.
2CH 28:8 Ndị Izrel sitere nʼetiti ụmụnne ha ndị Juda dọta ndị inyom, na ụmụ okorobịa, na ụmụ agbọghọbịa ọnụọgụgụ ha dị narị puku abụọ nʼagha. Ha bukọkwaara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha kwatara nʼagha laghachi na Sameria.
2CH 28:9 Ma Oded, onye amụma Onyenwe anyị, nọ na Sameria nʼoge a. Ọ pụrụ jekwuru ndị agha ahụ na Sameria sị ha, “Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha mere ka unu merie ndị Juda nʼihi na ha na-efe arụsị. Ma unu ji ọnụma gbuo ha, nke mere na ụzụ tụrụ ruo nʼeluigwe.
2CH 28:10 Ugbu a, unu na-achọkwa ime ndị ikom na ndị inyom Juda na Jerusalem ndị ohu unu? Ma unu abụghị ndị ikpe mmehie mara nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ?
2CH 28:11 Ugbu a, geenụ ntị nʼihe m na-ekwu. Kpọghachinụ ụmụnna unu ndị a unu dọtara nʼagha nʼụlọ ha, nʼihi na ugbu a Onyenwe anyị na-ewe oke iwe megide unu.”
2CH 28:12 Ụfọdụ ndịisi ndị Ifrem, bụ Azaraya nwa Jehohanan, na Berekaya nwa Meshilemot, na Jehizkaya nwa Shalum, na Amasa nwa Hadlai, biliri guzogide ndị ahụ si agha na-alọta.
2CH 28:13 Ha sịrị, “Unu akpọbatakwala ndị a unu dọtara nʼagha nʼebe a, nʼihi na unu mee ya, anyị ga-abụ ndị ikpe maara nʼihu Onyenwe anyị. Unu chọrọ ịtụkwasị ihe na mmehie na ikpe ọmụma anyị? Nʼihi na ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu, iwe ya dị ọkụ na-adịkwasịkwa nʼahụ Izrel.”
2CH 28:14 Ya mere, ndị agha ahụ hapụrụ ndị mkpọrọ ahụ na ihe niile ha bulatara, nʼihu ndị ozi na igwe mmadụ ahụ niile.
2CH 28:15 Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ akpọrọ nʼaha nʼaha duuru ndị mkpọrọ ahụ, manye aka nʼihe ahụ niile a dọtara nʼagha wepụta uwe, na nri, na mmanya na akpụkpọụkwụ, na mmanụ, nyeghachi ha ndị ahụ niile a dọtara nʼagha. Ha bulitere ndị ọrịa nọ nʼetiti ndị ahụ a dọtara nʼagha kukwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu. Emesịa, ha duuru mmadụ ahụ niile dughachiri ha ndị ha nọ na Jeriko, obodo nkwụ. Emesịakwa, ha laghachikwara azụ na Sameria.
2CH 28:16 Nʼoge ahụ, eze Ehaz zigara ndị eze Asịrịa ozi ka ọ bịa nyere ya aka.
2CH 28:17 Ndị Edọm bịara ọzọ buso Juda agha, ma dọrọkwa ọtụtụ nʼime ha nʼagha.
2CH 28:18 Ndị Filistia na-ebusokwa ụfọdụ obodo Juda dị na mgbada ugwu, na Negeb agha. Ha meriri ma bichikwaa obodo ndị a; Bet-Shemesh, na Aijalon, na Gederọt, na Soko, na Timna, na Gimzo, na obodo nta niile gbara ha gburugburu.
2CH 28:19 Ma Onyenwe anyị wedara Juda nʼala nʼihi Ehaz, eze Izrel onye mere ka ihe ọjọọ baa ụba na Juda, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya nye Onyenwe anyị.
2CH 28:20 Mgbe Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa bịara, o wetaara Ehaz nsogbu kama enyemaka.
2CH 28:21 Ehaz weere ụfọdụ ihe dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọeze, sitekwa na nʼụlọ ndịisi obodo, were ha nye eze Asịrịa, ma ihe ndị a enyereghị ya aka.
2CH 28:22 Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.
2CH 28:23 Ọ chụrụ aja nye chi niile nke Damaskọs, bụ ndị meriri ya nʼagha. Ọ sịrị, “Nʼihi na chi nke ndị eze Aram nyeere ha aka, ha ka m ga-achụrụ aja, ka ha nwee ike nyere m aka.” Ma ha bụ ihe wetaara ya ọdịda, bụrụkwa ọdịda nye Izrel niile.
2CH 28:24 Ehaz chịkọtara ngwongwo niile dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, gbujasịa ha. O mechiri ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ma wuo ọtụtụ ebe ịchụ aja na nkuku ụzọ niile nʼime Jerusalem.
2CH 28:25 Nʼobodo niile ọbụla na Juda, o wuru ebe dị elu maka ịchụ aja dị iche iche nye chi ndị ọzọ, si otu a kpasuo Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ya ha iwe.
2CH 28:26 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda na Izrel?
2CH 28:27 Ehaz soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Jerusalem, ma ọ bụghị nʼime ili ebe a na-eli ndị eze Izrel. Hezekaya nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2CH 29:1 Hezekaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Abija, ada Zekaraya.
2CH 29:2 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna nna ya Devid mere.
2CH 29:3 Nʼọnwa mbụ nke afọ ahụ e mere ya eze ka o meghere ụlọnsọ Onyenwe anyị, mezie ime ya.
2CH 29:4 Ọ kpọrọ ndị Livayị, na ndị nchụaja niile oku nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ukwu Chineke,
2CH 29:5 gwa ha okwu sị ha, “Geenụ m ntị unu ndị Livayị, doonụ onwe unu nsọ, dokwaanụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nsọ. Wezuganụ ihe arụ niile dị nʼebe nsọ nke ụlọnsọ ahụ.
2CH 29:6 Nʼihi na nna anyị ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi; ha mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, hapụ ya. Ha wepụrụ ihu ha site nʼebe obibi Onyenwe anyị, gbakụtakwa ya azụ.
2CH 29:7 Ha mechikwara ụzọ ndị e si abanye na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, menyụọkwa ọkụ dị nʼime ya. E sureekwaghị ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ọ dịkwaghị aja nsure ọkụ ọbụla a chụrụ nye Chineke nke Izrel.
2CH 29:8 Nʼihi nke a ka iwe Onyenwe anyị ji dakwasị Juda na Jerusalem. O meela ka ha buru ihe oke egwu, na oke ihere na oke ụjọ, dịka unu jirila anya unu hụ.
2CH 29:9 E gburu nna anyị ha nʼagha, dọtakwa ndị nwunye anyị na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa anyị nʼagha nʼihi ya.
2CH 29:10 Ma ugbu a, achọrọ m ka anyị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel gbaa ndụ, ka iwe ya jụrụ nʼebe anyị nọ.
2CH 29:11 Ụmụ m, o kwesighị ka unu gbakụta ọrụ unu azụ ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara unu iguzo nʼihu ya, na ijere ya ozi, na ịrụ ọrụ nʼihu ya, na ịchụrụ ya aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.”
2CH 29:12 Nʼoge a ndị Livayị ndị a malitere ọrụ: site nʼikwu Kohat: Mahat na Amasai, na Juel nwa Azaraya; nʼikwu Merari: Kish nwa Abdi, na Azaraya nwa Jehalelel; nʼikwu Geshọn: Joa nwa Zima, na Eden nwa Joa;
2CH 29:13 nʼikwu Elizafan: Shimri, na Jeiel; nʼikwu Asaf: Zekaraya, na Matanaya;
2CH 29:14 nʼikwu Heman: Jehiel, na Shimei; nʼikwu Jedutun: Shemaya, na Uziel.
2CH 29:15 Mgbe ha kpọkọtara ụmụnna ha bụ ndị Livayị, dokwaa onwe ha ọcha, ha bara ido ụlọnsọ Onyenwe anyị nsọ, dịka eze nyere nʼiwu, nʼusoro okwu Onyenwe anyị si dị.
2CH 29:16 Ndị nchụaja banyere nʼime ebe nsọ ahụ ido ya nsọ. Ihe niile na-adịghị ọcha ha hụrụ nʼime ya ka ha wepụtasịrị nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ndị Livayị buuru ha gaa bufuo na Ndagwurugwu Kidrọn.
2CH 29:17 Ha bidoro mmemme ido nsọ a nʼabalị mbụ nʼọnwa nke mbụ. Nʼabalị nke asatọ ha ruru na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma o were ha abalị asatọ ọzọ idochasị ụlọnsọ ahụ nsọ maka ofufe, ha jezuru ozi niile nʼabalị iri na isii nke ọnwa mbụ ahụ.
2CH 29:18 Mgbe ahụ, ha bakwuru eze bụ Hezekaya kọọrọ ya sị, “Anyị emeela ebe niile nʼụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ dị nsọ, ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na ngwongwo ya, na tebul ịdọba achịcha e doro nsọ, na ihe niile dị nʼime ya.
2CH 29:19 Ọzọ, anyị edoziela ma dokwaa ngwongwo ahụ niile nsọ, bụ nke eze Ehaz wepụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya mgbe ọ bụ eze. Ha dịkwa ugbu a nʼihu ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị.”
2CH 29:20 Nʼụtụtụ echi ya, eze bụ Hezekaya kpọkọtara ndịisi obodo niile, gaa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ.
2CH 29:21 Ha wetara oke ehi asaa, na ebule asaa, na ụmụ ebule asaa, na mkpi asaa, maka ịchụ aja mmehie nʼihi alaeze ahụ, maka ụlọnsọ ukwu ahụ, na ala Juda. Eze nyere ndị nchụaja bụ ụmụ Erọn iwu sị ha gbuo anụ ụlọ ndị ahụ nʼebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị.
2CH 29:22 Ya mere, ha gburu oke ehi ahụ niile. Ndị nchụaja fesara ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja. Ha gbukwara ebule ndị ahụ fesa ọbara ha nʼebe ịchụ aja, gbukwaa ụmụ atụrụ ndị ahụ fesakwa ọbara ha nʼebe ịchụ aja.
2CH 29:23 Ha wetara mkpi ndị ahụ eji achụ aja mmehie nʼihu eze na ọgbakọ ahụ, ha bikwasịkwara ha aka nʼelu.
2CH 29:24 Ndị nchụaja gburu mkpi ndị ahụ, chee ọbara ha nʼelu ebe nchụaja maka ikpuchi mmehie ndị Izrel niile. Nʼihi na eze nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ na aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile.
2CH 29:25 O mere ka ụfọdụ ndị Livayị nọdụ nʼụlọnsọ ahụ, dịka ndị na-abụ abụ. O nyere ha ogene, na une, na ụbọ akwara. O mere nke a nʼusoro dịka Devid na Gad, bụ ọhụ ụzọ eze, na Netan, bụ onye amụma, nke a bụ dịka Onyenwe anyị nyererịị nʼiwu site nʼaka ndị amụma ya.
2CH 29:26 Ya mere, ndị Livayị ji ihe egwu Devid ndị ahụ niile guzoro na njikere, ma ndị nchụaja jikwa opi ha nke ha na-afụ.
2CH 29:27 Hezekaya nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ ahụ nʼelu ebe ịchụ aja. Mgbe a malitere isure aja ahụ ọkụ, a malitekwara ịbụ abụ nye Onyenwe anyị, na ịfụ opi na iti ihe egwu niile nke Devid, eze Izrel.
2CH 29:28 Nʼoge mmemme ọchụchụ aja ahụ, mmadụ niile kpọrọ isiala nye Chineke, mgbe ndị abụ na-abụ abụ, ndị opi na-afụkwa opi ha. Ihe niile a nọ na-eme tutu ruo mgbe a chụsịrị aja niile ahụ.
2CH 29:29 Mgbe ha chụchara aja ndị ahụ, eze na ndị niile nọ nʼebe ahụ gburu ikpere nʼala, kpọkwaa isiala.
2CH 29:30 Eze Hezekaya na ndịisi ozi ya nyere iwu ka ndị Livayị bụọ ụfọdụ nʼime abụ ọma Devid, na nke Asaf onye amụma, maka iji ya too Onyenwe anyị. Ha mere otu a, kpọọkwa isiala nye Chineke.
2CH 29:31 Emesịa, Hezekaya sịrị, “Ugbu a unu edoola onwe unu nsọ nye Onyenwe anyị, bịanụ nso, webatanụ aja na onyinye ekele nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.” Ya mere, nzukọ ahụ niile wetaara aja na onyinye ekele ha, ndị niile nwere mkpebi nʼobi ha wetara aja nsure ọkụ.
2CH 29:32 Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile ha wetara bụ ndị a: iri oke ehi asaa, na narị ebule, na narị ụmụ ebule abụọ, ka e wetara maka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
2CH 29:33 Anụ ndị e doro nsọ maka ịchụ aja dị narị oke ehi isii na atụrụ na ewu dị puku atọ.
2CH 29:34 Ma ndị nchụaja dị ole na ole, ha apụghịkwa ịgba akpụkpọ anụ niile ahụ maka aja nsure ọkụ, nʼihi ya, ụmụnne ha bụ ndị Livayị nyeere ha aka tutu ruo mgbe ozi ahụ gwụsịrị, ruokwa mgbe e doro ndị nchụaja ndị ọzọ nsọ. Nʼihi na ndị Livayị nwere obi ziri ezi karịa ndị nchụaja ido onwe ha nsọ.
2CH 29:35 Aja nsure ọkụ bara ụba, tinyere abụba nke aja udo niile, na aja ihe ọṅụṅụ nke so aja nsure ọkụ ndị a. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si weghachite ije ozi na ịchụ aja nke na-adị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2CH 29:36 Hezekaya na ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ihe Chineke doziri nye ndị ya, nʼihi na ihe niile ndị a mere ngwangwa.
2CH 30:1 Hezekaya zigaara ndị Izrel na Juda niile ozi, degakwara ndị Ifrem na Manase akwụkwọ ịkpọ oku ka ha bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.
2CH 30:2 Eze na ndịisi ya, na ndị nkpọkọta niile na Jerusalem kpebiri na Mmemme Ngabiga a ga-adị nʼọnwa nke abụọ.
2CH 30:3 Ha enweghị ike ime ya nʼoge e kwesiri ime ya nʼihi na ọtụtụ ndị nchụaja enwebeghị ike doo onwe ha nsọ nʼọnwa ahụ. Otu a kwa, ndị Izrel enwebeghịkwa ike zukọtaa na Jerusalem.
2CH 30:4 Eze na Izrel niile nwere otu mkpebi ime ya otu a.
2CH 30:5 Ha kpebiri ka e kwusaa nʼala Izrel niile site na Dan ruo na Bịasheba ka onye ọbụla bịa na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Ọtụtụ mmadụ nʼIzrel esobeghị mee mmemme a dịka e nyere ya nʼiwu.
2CH 30:6 Ndị ọgba ọsọ weere akwụkwọ ozi sitere nʼaka eze na ndị ozi ya jegharịa nʼIzrel na Juda niile dịka ihe eze nyere nʼiwu si: “Unu ndị Izrel, lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ka ọ laghachikwute unu bụ ndị eze Asịrịa na-emeribeghị.
2CH 30:7 Unu adịkwala ka nna unu ha, na ụmụnne unu ndị Izrel, ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ha, nke a mere o jiri were ha mee ihe iju anya, dịka unu hụrụ ya.
2CH 30:8 Unu abụla ndị isiike dịka ha, kama werenụ onwe unu nye Onyenwe anyị. Bịakwanụ nʼụlọnsọ ya nke o doro nsọ ruo ebighị ebi. Fee Onyenwe anyị Chineke unu ofufe, ime ka iwe ya jụrụ nʼebe unu nọ.
2CH 30:9 Ọ bụrụ na unu alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka e gosi ụmụnna unu na ụmụ unu a dọtara nʼagha obi ebere, meekwa ka ha site nʼebe e bugara ha lọghachikwa. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ onye obi ebere, na onye obiọma; ọ gakwaghị agbakụta unu azụ, ma ọ bụrụ na unu echegharịa, lọghachikwute ya.”
2CH 30:10 Ya mere, ndị ọgbọ ọsọ ozi ahụ sitere otu obodo gaa obodo ọzọ nʼIfrem, na Manase, ọ bụladị ruo Zebụlọn. Ma ndị mmadụ chịrị ha ọchị, kwaakwa ha emo.
2CH 30:11 Ma otu ọ dị, ụfọdụ ndị si nʼebo Asha na Manase, na Zebụlọn wedatara onwe ha ala, bịa Jerusalem.
2CH 30:12 Ma aka Chineke dịnyere ndị Juda inye ha otu obi, ime ihe eze na ndịisi ya nyere nʼiwu, site nʼokwu Onyenwe anyị.
2CH 30:13 Ya mere, ọtụtụ mmadụ bịara Jerusalem nʼọnwa nke abụọ nke afọ ahụ, maka mmemme achịcha ekoghị eko.
2CH 30:14 Ha niile jiri otu obi bibie ụlọ arụsị Baal niile dị na Jerusalem, kụtuokwa ebe ịchụ aja na-esi isi ụtọ niile, buru ha niile bufuo ha na Ndagwurugwu Kidrọn.
2CH 30:15 Nʼabalị nke iri na anọ nke ọnwa abụọ ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gburu atụrụ Mmemme Ngabiga ha. Nke a mere ka ihere mee ndị nchụaja na ndị Livayị. Ha mekwara ngwangwa doo onwe ha nsọ were aja nsure ọkụ bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2CH 30:16 Ha niile guzokwara nʼọnọdụ ha dịka e dere ya nʼiwu Mosis, onye nke Chineke. Ndị nchụaja fesara ọbara nke ndị Livayị bunyere ha nʼaka, nʼelu ebe ịchụ aja.
2CH 30:17 Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị so nʼigwe mmadụ ahụ edobeghị onwe ha nsọ, ndị Livayị gbuuru ha atụrụ Mmemme Ngabiga nʼihi na ha adịghị ọcha, ha apụghịkwa ido atụrụ ha nsọ nye Onyenwe anyị.
2CH 30:18 Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị sitere nʼIfrem, na Manase, na Isaka, na Zebụlọn edoghị onwe ha ọcha, ma ha sokwa rie oriri ngabiga ahụ, si otu a mebie ihe e dere nʼiwu. Ma Hezekaya kpeere ha ekpere sị, “Ka Onyenwe anyị onye dị mma gbaghara onye ọbụla
2CH 30:19 bụ ndị ji obi ha na-achọ Onyenwe anyị Chineke nke nna nna ha, ọ bụladị ma ọ bụrụ na ha adịghị ọcha dịka iwu nke ebe nsọ si dị.”
2CH 30:20 Onyenwe anyị nụrụ ekpere Hezekaya gwọọkwa ha.
2CH 30:21 Ya mere, ndị Izrel ahụ niile ji ọṅụ mee mmemme achịcha ekoghị eko ahụ na Jerusalem ụbọchị asaa. Ma ndị nchụaja na ndị Livayị ji abụ na ngwa egwu Onyenwe anyị too ya otuto ụbọchị ahụ niile.
2CH 30:22 Hezekaya ji okwu dị mma gbaa ndị Livayị ume nʼihi ezi nghọta ha nwere nʼijere Onyenwe anyị ozi. Nʼime ụbọchị asaa ahụ niile, ha chụrụ aja udo, riekwa ihe ha ketara site nʼaja niile a chụrụ. Ha tokwara Onyenwe anyị Chineke nna nna ha otuto.
2CH 30:23 Nʼihi oke ọṅụ ha niile nwere, ha kpebiri ime mmemme ahụ gaa nʼihu ụbọchị asaa ọzọ.
2CH 30:24 Hezekaya eze Juda, nyere nzukọ ahụ otu puku oke ehi, na puku atụrụ asaa. Ndị ozi eze niile nyekwara ha, otu puku oke ehi na puku atụrụ iri. Ọtụtụ ndị nchụaja dooro onwe ha nsọ.
2CH 30:25 Nʼoge ahụ kwa, oke ọṅụ jupụtara nʼobi ndị Juda niile, na nʼobi ndị nchụaja na ndị Livayị, na nʼobi ndị ọbịa, na ndị sitere ala Izrel bịa.
2CH 30:26 Oke ọṅụ jupụtara na Jerusalem nʼihi na site nʼoge Solomọn nwa Devid, eze Izrel ruo nʼoge a, e mebeghị mmemme dị otu a na Jerusalem.
2CH 30:27 Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị Livayị guzoro gọzie ọha mmadụ ahụ niile. Chineke nụkwara ekpere ha site nʼebe obibi ya dị nsọ nke eluigwe.
2CH 31:1 Mgbe ihe niile a gwụsịrị, ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ pụrụ gaa nʼobodo niile dị na Juda, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. Ha kwatụrụ ebe niile dị elu na ebe ịchụ aja niile dị na Juda, Benjamin, Ifrem na Manase. Mgbe ha lachara ha niile nʼiyi, ndị Izrel niile laghachiri nʼobodo nke aka ha nakwa nʼihe onye ọbụla nwere.
2CH 31:2 Hezekaya kenyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị nʼusoro ịrụ ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke ụbọchị niile, maka ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo, na inye ekele, na ito Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ama ebe obibi ya.
2CH 31:3 Eze nyekwara ụtụ nke ya site nʼihe nweta ya maka iji chụọ aja nsure ọkụ, nke ụtụtụ na abalị, ya na aja nsure ọkụ nke ụbọchị izuike niile na ọnwa ọhụrụ, na nke mmemme niile a kara aka a na-eme dịka ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị.
2CH 31:4 O nyekwara ndị bi na Jerusalem iwu ka ha na-ewebatara ndị nchụaja na ndị Livayị oke nke ruuru ha, ka ha nwee ike lebanye anya nke ọma nʼiwu Onyenwe anyị.
2CH 31:5 Ngwangwa e kwusara okwu a, ụmụ Izrel niile wetara onyinye ha nʼebe ọ bara ụba. Ha wetara mkpụrụ mbụ nke ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ ha, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ, na ihe omume niile nke ubi. Ha wetakwara nʼụba otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile ọzọ ha nwere.
2CH 31:6 Ndị Izrel na Juda niile bi nʼobodo Juda bubatakwara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ, na otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe nsọ niile edoro nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Ha doro ha niile nʼukwu nʼukwu
2CH 31:7 Ha bidoro iwebata ihe ndị a site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ruo nʼọnwa nke asaa.
2CH 31:8 Mgbe Hezekaya na ndịisi ya bịara hụ ukwu ihe ndị ahụ niile, ha toro Onyenwe anyị, gọziekwa ndị ya bụ Izrel.
2CH 31:9 Hezekaya jụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị banyere onyinye ndị ahụ e bubatara.
2CH 31:10 Azaraya, onyeisi nchụaja, onye sitere nʼikwu Zadọk zara sị ya; “Lee, kemgbe ndị mmadụ malitere iwebata onyinye ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị o nwebeghị ihe kọrọ anyị. Nʼezie, anyị nwere karịa, nʼihi na Onyenwe anyị agọziela ndị ya. Leekwa ihe dị ukwuu ka fọdụrụ.”
2CH 31:11 Hezekaya nyere iwu ka e edozie ụlọ ịchịkọba ihe nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ha mekwara otu a.
2CH 31:12 Emesịa, ha jiri ikwesi ntụkwasị obi bubata onyinye ndị ahụ, na onyinye nke otu ụzọ nʼime ụzọ iri, na onyinye e doro nsọ, tifee ha nʼaka Konanaya, onye Livayị. Shimei nwanne ya nwoke bụ onye na-esote ya.
2CH 31:13 Jehiel, Azazaya, Nahat, Asahel, Jerimot, Jozabad, Eliel, Ismakaya, Mahat na Benaya, bụ ndị nlekọta ọrụ ndị nọ nʼokpuru Konanaya na Shimei nwanne ya. Ndị a niile bụ ndị eze Hezekaya na Azaraya onye nlekọta ụlọnsọ ukwu Chineke họpụtara.
2CH 31:14 Kore nwa Imna, onye Livayị, onye bụkwa onye na-elekọta ọnụ ụzọ ama dị nʼọwụwa anyanwụ, ka e tinyere ọrụ ilekọta onyinye afọ ofufu niile e wetaara Chineke. Ọ bụ ya nwekwa ọrụ ikesa onyinye ndị ahụ niile e bubataara Onyenwe anyị ha na onyinye ndị ọzọ e doro nsọ.
2CH 31:15 Ndị na-enyere ya aka bụ Eden, Miniamin, Jeshua, Shemaya, Amaraya na Shekanaya. Ha na-eke onyinye ahụ nye ndị nchụaja niile nʼobodo ahụ, onye ukwu na onye nta, dịka usoro ịrụ ọrụ ha si dị. Ha ji ikwesi ntụkwasị obi na-enyere ya aka.
2CH 31:16 Ọzọkwa, ndị ikom niile si nʼezinaụlọ ndị nchụaja, ndị gbara site nʼafọ atọ gbagoo, ndị aha ha dị nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na-eketa oke ihe oriri ha na-eri mgbe ọbụla ha bịara ịrụ ọrụ dịka usoro ọrụ ha si dị.
2CH 31:17 Ha na-ekenye ndị nchụaja niile e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, kenyekwa ndị Livayị niile gbara site iri afọ abụọ gbagoo ihe oriri dịka usoro ọrụ ha si dị.
2CH 31:18 Ndị na-esokwa keta oke ndị a bụ ụmụntakịrị, na ndị inyom, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom na-etolite etolite, bụ ndị niile e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ndị a bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼido onwe ha nsọ.
2CH 31:19 A họpụtara ụfọdụ ndị ikom ndị ọrụ ha bụ ike nri nye ndị nchụaja niile bụ ụmụ ụmụ Erọn. Ndị nchụaja a na-ekwu ihe banyere ha nʼebe a bụ ndị ahụ bi nʼala ubi nke gbara obodo ndị nchụaja gburugburu, maọbụ ndị bi nʼobodo ndị ọzọ. Ndị a bụkwa ndị e dere aha ha niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ndị Livayị.
2CH 31:20 Ndị a bụ ihe ndị Hezekaya mere nʼime Juda niile, ọ na-eme ihe dị mma, na nke ziri ezi, nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke ya.
2CH 31:21 Nʼime ihe niile o mere, nke metụtara ije ozi nke ụlọ ukwu Chineke, na idebe iwu niile na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere, Hezekaya ji obi ya niile gbasoo Chineke. O jikwa obi ya niile jee ozi niile o jere. Nke a mekwara ka ihe gaara ya nke ọma.
2CH 32:1 Mgbe Hezekaya ji ikwesi ntụkwasị obi rụchaa ọrụ ndị a niile, Senakerib bụ eze Asịrịa, bịara nʼime Juda megide ya. Ọ nọchibidoro obodo niile nke e wusiri ike, na-eche na ọ ga-emeri ha nye onwe ya.
2CH 32:2 Mgbe o doro eze anya na Senakerib bịara ka o buo agha megide Jerusalem,
2CH 32:3 Hezekaya mere ngwangwa kpọkọta ụmụ eze niile na ndịisi agha ya. Mgbe ha zukọtara, ha kpebiri iwuchi isi iyi ahụ niile na-esi nʼazụ obodo na-asọpụta. Ha mekwara otu a.
2CH 32:4 Ha kpọkọtara ọtụtụ ndị ọrụ, ndị gara gbochie isi iyi niile, mee ka mmiri gharakwa ịsọpụta nʼala ahụ niile. Ha mere nke a nʼihi na ha achọghị ka eze ndị Asịrịa na ndị agha ya nweta mmiri ha ga-aṅụ mgbe ha bịaruru ibuso Jerusalem agha.
2CH 32:5 Hezekaya wuzikwara mgbidi obodo ahụ, wusie ha ike nʼebe niile ọ na-ada ada. O wukwara mgbidi ọzọ gburugburu mgbidi nke ochie ahụ. O wusikwara ebe siri ike nke Milo dị nʼobodo Devid ike, kpụọkwa ọtụtụ ngwa agha na ọta.
2CH 32:6 O tinyere ndị agha niile nọ nʼobodo ahụ nʼokpuru ndịisi agha na-achị ha, mee ka ha niile zukọta nʼọnụ ụzọ ama nke obodo. Nʼebe ahụ ka ọ nọ gwa ha okwu sị ha,
2CH 32:7 “Dịrịnụ ike, unu adakwala mba. Unu atụla ụjọ maọbụ daa mba nʼihi eze Asịrịa na usuu ndị agha ya, nʼihi na onye dịnyeere anyị ka ya ike.
2CH 32:8 Ihe nọnyere ya bụ ogwe aka nke anụ ahụ, ma nke nọnyere anyị bụ Onyenwe anyị, Chineke anyị, inyere anyị aka na ibu agha anyị niile.” Okwu a, nke Hezekaya bụ eze Juda kwuru, mere ka ndị Juda nwee agbamume.
2CH 32:9 Mgbe e mesiri, mgbe Senakerib eze Asịrịa na ndị agha ya niile nọchibidoro Lakish, o zipụrụ ndị ọrụ ya gaa Jerusalem, ka ha jiri ozi a gaa maka Hezekaya, bụ eze Juda na ndị Juda niile ndị nọ nʼebe ahụ:
2CH 32:10 “Nke a bụ ihe Senakerib, bụ eze Asịrịa sịrị: Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere, mere i ji nọgidesie ike na Jerusalem nʼọnọdụ nnọchibido a?
2CH 32:11 Mgbe Hezekaya na-asị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke anyị ga-azọpụta anyị site nʼaka eze Asịrịa,’ ọ bụ aghụghọ ka ọ na-aghọ unu. Ọ na-eduhie unu, na-achọ ka unu nwụọ nʼagụụ nakwa akpịrị ịkpọ nkụ.
2CH 32:12 Ọ bụghị Hezekaya na onwe ya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, ‘Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼotu ebe ịchụ aja, chụọkwa aja nʼelu ya’?
2CH 32:13 “Unu amaghị ihe mụ na nna m ha bụ ndị bu m ụzọ chịa mere ndị ala ọzọ? Chi niile nke mba ndị ahụ niile ha nwere ike zọpụta ala ha site nʼaka m?
2CH 32:14 Ọ bụ onye nʼetiti chi niile nke mba ndị a niile, bụ ndị nna nna m ha bibiri, napụtarala ndị ya site nʼaka m? Aṅaa ka chi unu ga-esi zọpụta unu site nʼaka m?
2CH 32:15 Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu, rafuokwa unu otu a. Unu ekwenyekwarala ya, nʼihi na ọ dịghị chi ọbụla maọbụ nke mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla pụrụ ịnapụta ndị ya site nʼaka m maọbụ nʼaka nna m ha. Ka ọ bụrụzie chi unu ga-abụ nke ga-anapụta unu site nʼaka m!”
2CH 32:16 Nʼụzọ dị otu a ka ndị ozi Senakerib ahụ ji leda Onyenwe anyị Chineke, na Hezekaya anya kwuokwa okwu mkparị megide ha.
2CH 32:17 Emesịa, Senakerib dekwara akwụkwọ mkparị ndị ọzọ, nke ọ nọ nʼime ya kwuluo Onyenwe anyị Chineke Izrel, na-asị, “Dịka chi ndị ala ọzọ niile enweghị ike zọpụta ndị ha site nʼaka m, otu a kwa, Chineke nke Hezekaya apụghịkwa ịzọpụta ndị ya site nʼaka m.”
2CH 32:18 Mgbe ahụ, ha ji oke olu kpọkuo ndị Jerusalem, bụ ndị nọ na mgbidi ahụ nʼasụsụ Hibru, imenye ha egwu nakwa ime ka ụjọ tụọ ha, ka ha nwee ike were obodo ahụ.
2CH 32:19 Ha kwuru okwu ọjọọ dị iche iche banyere Chineke nke Jerusalem, dịka ha si kwuo megide chi niile nke ndị ọzọ dị nʼụwa, bụ ọrụ aka mmadụ.
2CH 32:20 Mgbe ahụ, Hezekaya bụ eze, na Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, kpọkuru Chineke nke eluigwe nʼekpere.
2CH 32:21 Onyenwe anyị zipụrụ otu mmụọ ozi, onye gara tigbuo ndị agha niile bụ dike, ndị ọchịagha na ndịisi niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu nke eze Asịrịa. Ya mere, Senakerib ji oke ihere laghachi nʼala ya. Ma mgbe ọ gara nʼụlọ chi ya, ụfọdụ nʼime ụmụ ya ndị ikom, ndị bụ anụ ahụ na ọbara ya, were mma agha gbuo ya nʼebe ahụ.
2CH 32:22 Otu a ka Onyenwe anyị si zọpụta Hezekaya na ndị Jerusalem, site nʼaka Senakerib eze Asịrịa, na sitekwa nʼaka ndị iro ya ndị ọzọ. Udo dịkwara nʼala ya niile.
2CH 32:23 Site nʼoge ahụ, Hezekaya ghọrọ eze a maara aha ya na mba niile dị Juda gburugburu. Ọtụtụ mmadụ bidokwara ibutere Onyenwe anyị onyinye dị iche iche na Jerusalem. Hezekaya nʼonwe ya nwetakwara onyinye nke ya.
2CH 32:24 Ma nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa, ruo na ọ gaara anwụ. Ma o kpere ekpere rịọ Onyenwe anyị ka ọ gwọọ ya. Ọ zara ekpere ya, gosikwa ya ihe ịrịbama dị ebube.
2CH 32:25 Ma Hezekaya ejighị obi ya niile kelee Chineke ekele nʼihi na nganga batara ya nʼobi. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị megide ya na ndị Jerusalem na Juda.
2CH 32:26 Mgbe Hezekaya na ndị Jerusalem wedara onwe ha nʼala, iwe Onyenwe anyị dajụrụ nʼebe ha nọ, ọ takwaghị ha ahụhụ nʼoge niile ahụ Hezekaya dị ndụ.
2CH 32:27 Ya mere, Hezekaya ghọrọ eze bara ọgaranya, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. O wuru ụlọakụ maka ichebe ọlaọcha ya na ọlaedo, na nkume dị oke ọnụahịa, na ụda na-esi isi ụtọ, na ọta na efere ọlaedo ya.
2CH 32:28 O wukwara ọtụtụ ụlọ ọzọ ebe a na-echebe ọka, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv. O wukwara ụlọ anụmanụ maka ọtụtụ igwe ewu na atụrụ ya.
2CH 32:29 O wukwara ọtụtụ obodo nta dị iche iche, nweekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, nʼihi na Chineke mere ka ọ baa ụba.
2CH 32:30 Hezekaya bụkwa onye gbochiri mmiri iyi Gaihọn nʼakụkụ elu elu ya, gwuo olulu ebe mmiri ahụ si sọgharịa na-asọbata nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo Devid. Ihe niile o mere gaara ya nke ọma.
2CH 32:31 Ma mgbe ndị ozi nke ndị na-achị Babilọn zitere ka ha jụọ ya banyere ihe ebube ahụ nke mere nʼala ahụ, Chineke hapụrụ ya i nwalee ya, ka ọ mara ihe niile dị ya nʼobi.
2CH 32:32 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, na ọrụ ebere niile nke ọ rụrụ ka edere nʼakwụkwọ ọhụ onye amụma bụ Aịzaya, nwa Emọz, dịkwa nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda na Izrel niile.
2CH 32:33 Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ, e lie ya nʼugwu nʼebe ili ndị nna nna Devid dị. Ndị Juda niile na ndị niile bi na Jerusalem kwanyere ya ugwu nʼọnwụ ya. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2CH 33:1 Manase gbara afọ iri na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ ise na ise na Jerusalem.
2CH 33:2 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, site nʼịgbaso ihe arụ niile nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na mbụ mere, bụ ndị Onyenwe anyị chụpụrụ nʼihu ndị Izrel.
2CH 33:3 O wugharịrị ebe dị elu niile nke nna ya Hezekaya kwadara, o wukwara ebe ịchụ aja dị iche iche nke Baal, pịakwa ogidi Ashera dị iche iche. Ọ kpọrọ isiala nye usuu ihe niile nke dị na mbara eluigwe feekwa ha ofufe.
2CH 33:4 O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya, sị, “Aha m ga-adịgide na Jerusalem ruo mgbe ebighị ebi.”
2CH 33:5 O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe nʼogige abụọ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
2CH 33:6 O jikwa ụmụ ya chụọ aja nʼime ọkụ na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ọ gbara aja, taa amụsụ, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo iwe ya.
2CH 33:7 O were oyiyi apịrị apị nke o mere debe nʼime ụlọnsọ Chineke, nke Chineke gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi.
2CH 33:8 Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel hapụ ala ahụ nke m kenyere nna nna unu, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu banyere iwu niile, ụkpụrụ niile na ntụziaka niile m nyere site nʼaka Mosis.”
2CH 33:9 Ma Manase duhiere Juda na ndị Jerusalem, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị Onyenwe anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel.
2CH 33:10 Onyenwe anyị gwara Manase na ndị ya okwu, ma ha egeghị ntị.
2CH 33:11 Nʼihi ya, Onyenwe anyị mere ka ndị ọchịagha nke eze ndị Asịrịa bịa buso ha agha, bụ ndị jidere Manase, gbanye ya nko igwe nʼimi, were ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya laa Babilọn.
2CH 33:12 Nʼoge ahụ ka anya doro Manase. O wedara onwe ya ala nke ukwuu, rịọọ amara site nʼaka Onyenwe anyị Chineke nna nna ya.
2CH 33:13 Onyenwe anyị nụrụ arịrịọ ya mee ya ka ọ lọtakwa nʼalaeze ya na Jerusalem. Mgbe ahụ, Manase matara na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie.
2CH 33:14 Ọ bụ nʼoge a ka o wughachiri mgbidi nke abụọ gburugburu obodo Devid, na mgbidi dị nʼọdịda anyanwụ iyi Gaihọn na ndagwurugwu Kidrọn. Site nʼebe ahụ, o wuru ya ruo nʼọnụ ụzọ ama Azụ, na gburugburu ugwu Ofel ebe o wuliri ya elu. O dokwara ndịisi agha ya nʼobodo niile e wusiri ike dị na Juda.
2CH 33:15 O wezugara chi ndị mba ọzọ niile, wepụkwa oyiyi ahụ o tinyere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kụtuokwa ụlọ arụsị o wuru nʼugwu ụlọnsọ, na ndị nke o wuru na Jerusalem. O sitere nʼobodo bufuo ha.
2CH 33:16 Emesịa, o wugharịrị ebe ịchụ aja Onyenwe anyị dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, chụọ aja udo na aja ekele nʼelu ya. O nyekwara ndị Juda niile iwu sị ha fee Onyenwe anyị Chineke nke Izrel ofufe.
2CH 33:17 Ma ụfọdụ ndị Juda nọgidekwara na-achụ aja nʼugwu, maọbụ naanị Onyenwe anyị Chineke ha ka ha na-achụrụ aja ndị a.
2CH 33:18 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ekpere nke o kpeere Chineke ya, na okwu niile ndị ọhụ gwara ya nʼaha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Izrel niile.
2CH 33:19 Ekpere ya, na ọsịsa Chineke zara ya, na mmehie ya niile, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya, na ebe niile o wuru ụlọ arụsị nʼelu ugwu, na ebe ọ manyere ogidi arụsị Ashera, na arụsị ndị ọzọ, tupu o weda onwe ya ala, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị amụma.
2CH 33:20 Manase sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼụlọeze ya. Amọn, ọkpara ya, nọchiri ya.
2CH 33:21 Amọn gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ abụọ na Jerusalem.
2CH 33:22 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Manase mere. Amọn kpọrọ isiala, chụọkwa aja nye arụsị niile, nke Manase mere.
2CH 33:23 Ma o wedaghị onwe ya ala nʼihu Onyenwe anyị dịka Manase nna ya mere. Kama Amọn gara nʼihu mee ka ikpe ọmụma ya mụbaa.
2CH 33:24 Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu ya nʼime ụlọeze ya.
2CH 33:25 Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere Josaya nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya.
2CH 34:1 Josaya gbara afọ asatọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị iri afọ atọ na otu na Jerusalem.
2CH 34:2 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, gbasookwa ụzọ niile nke nna nna ya Devid, o sighị nʼụzọ a wezuga onwe ya gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.
2CH 34:3 Nʼafọ nke asatọ nke ọchịchị ya, mgbe ọ ka bụ okorobịa, o bidoro iji obi ya niile na-achọ Chineke nke nna ya Devid. Nʼafọ iri na abụọ nke ọchịchị ya, ọ malitere ime ka Juda na Jerusalem dị ọcha site nʼiwezuga ebe ịchụ aja niile dị elu, na ogidi Ashera niile, na arụsị a pịrị apị na nke a kpụrụ akpụ niile.
2CH 34:4 Nʼihu ya o mere ka a kwatuo ebe ịchụ aja Baal nʼike. Ọ kụdara ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị nʼelu ebe ịchụ aja Baal ndị ahụ, tijisie ogidi Ashera niile, na arụsị na oyiyi niile. Ọ kụjasịrị ha niile, kpokọrọ ha ghasaa ha nʼelu ili ndị na-efe ha.
2CH 34:5 Ọ kpọrọ ọkpụkpụ ndị nchụaja ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja arụsị ha, si otu a mee ka Juda na Jerusalem dị ọcha.
2CH 34:6 Nʼobodo ndị Manase, na Ifrem na Simiọn, ruo na Naftalị, na mkpọmkpọ ebe ha niile gburugburu.
2CH 34:7 O titụrụ ebe ịchụ aja nke arụsị niile na ogidi arụsị Ashera, gwepịa arụsị ndị a niile dịka ntụ. Otu a ka o mere nʼala Izrel niile tupu ọ laghachi Jerusalem.
2CH 34:8 Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, mgbe o mere ka ala ahụ na ụlọnsọ dị ọcha, o zigara Shefan nwa Azalaya, Maaseia onye na-achị obodo, na Joa nwa Joahaz, onye na-edekọ akụkọ, ka ha wuzie ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ Chineke ya.
2CH 34:9 Ha jekwuru Hilkaya onyeisi nchụaja nye ya ego nke e webatara nʼụlọnsọ Chineke, nke ndị Livayị bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nakọtara site nʼaka ndị Manase na Ifrem, na ndị niile fọdụrụ nʼIzrel, na sitekwa nʼaka ndị Juda na Benjamin, na ndị niile bi na Jerusalem.
2CH 34:10 Mgbe ahụ, ha nyefere ya nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ọrụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ndị ikom a kwụrụ ndị ọrụ rụziri ma mezie ụlọnsọ ahụ ụgwọ.
2CH 34:11 Ha nyekwara ndị ọkpọ ǹtu na ndị na-ewu ụlọ ego iji zụta nkume a wara awa, osisi iji mee ihe njikọta na osisi ịkwado ụlọ, maka iji rụzie ụlọ a nke ndị eze Juda hapụrụ ka ọ dakasịa.
2CH 34:12 Ndị ọrụ a rụrụ ọrụ ha nʼikwesị ntụkwasị obi. Ndị nlekọta ha bụ ndị Livayị ndị a: Jahat na Ọbadaya ndị si nʼikwu Merari, na Zekaraya na Meshulam ndịisi nʼikwu Kohat. Ndị Livayị ndị ọzọ, ndị bụ ndị nwere nghọta nʼiti ngwa egwu dị iche iche
2CH 34:13 ka e mere ndị nlekọta ndị na-ebu ibu. Ha lekọtakwara ndị niile rụrụ ọrụ dị iche iche. Ụfọdụ nʼime ndị Livayị ndị a bụ ndị ode akwụkwọ na ndị na-edekọ ihe, na ndị na-eche ọnụ ụzọ nche.
2CH 34:14 Mgbe ha na-ewepụta ego anabatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, Hilkaya onye nchụaja chọtara akwụkwọ Iwu Onyenwe anyị, bụ nke o nyere site nʼaka Mosis.
2CH 34:15 Hilkaya sịrị Shefan ode akwụkwọ, “Achọtala m Akwụkwọ Iwu nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.” O nyere ya Shefan.
2CH 34:16 Mgbe ahụ, Shefan buuru akwụkwọ ahụ wegara ya eze, gwa ya sị, “Ndị ozi gị na-eje ozi ha dịka ihe niile i tinyere ha nʼaka si dị.
2CH 34:17 Ha enyefela ego niile nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼaka ndị nlekọta ọrụ, na ndị ọrụ.”
2CH 34:18 Emesịa, Shefan ode akwụkwọ gwara eze okwu ọzọ sị ya, “O nwere akwụkwọ Hilkaya nyere m.” Shefan wepụtara ya gụọ ya na ntị eze.
2CH 34:19 Mgbe eze nụrụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya.
2CH 34:20 O nyere Hilkaya, Ahikam nwa Shefan, Abdon nwa Maịka, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha,
2CH 34:21 “Gaanụ jụta Onyenwe anyị ase, nʼisi m na nʼisi ndị fọdụrụ nʼIzrel na Juda, banyere ihe niile e dere nʼakwụkwọ a bụ nke achọtara. Nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị dị ukwuu bụ nke a wụkwasịrị anyị, nʼihi na ndị bu anyị ụzọ edebeghị okwu nke Onyenwe anyị, ha agbasoghị ihe niile e dere nʼime akwụkwọ a banyere anyị.”
2CH 34:22 Ya mere, Hilkaya na ndị ahụ eze zipụrụ ya na ha, jekwuuru Hulda, onye amụma nwanyị, onye bụ nwunye Shalum, nwa Tokhat, nwa Hasra. Onye nlekọta ebe a na-edebe uwe. Hulda na-ebi na mpaghara Jerusalem e wuru ọhụrụ.
2CH 34:23 Ọ sịrị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, kwuru: Gwanụ nwoke ahụ ziri unu ka unu bịakwutem, sị
2CH 34:24 ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga iweta mbibi ga-adakwasị ebe a na ndị niile bi nʼime ya, ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a, bụ nke a gụpụtara nʼihu eze Juda.
2CH 34:25 Nʼihi na ha ajụla m, gbakụta m azụ, chụọ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, kpasuo m iwe site na ihe niile nke aka ha mepụtara, a ga-awụkwasị iwe m nʼebe a, ọ gaghị akwụsịkwa.’
2CH 34:26 Gwanụ eze Juda, onye ahụ zitere unu ịjụta ase site nʼọnụ Onyenwe anyị sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu banyere okwu ndị ahụ ị nụrụ.
2CH 34:27 Nʼihi na o wutere gị nʼobi, na i wedakwara onwe gị nʼala nʼihu Chineke, mgbe ị nụrụ ihe o kwuru megide ebe a na ndị bi nʼime ya, nʼihi na i wedara onwe gị nʼala nʼihu m, ma dọwaakwa uwe gị, bekwaa akwa nʼihu m. Mụ onwe m anụla, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
2CH 34:28 Ugbu a, aga m achịkọta gị nye nna nna gị ha, a ga-eli gị nʼudo. Anya gị agaghị ahụ mbibi nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ebe a na ndị bi nʼime ya.’ ” Ha laghachiri inye eze ọsịsa ya.
2CH 34:29 Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị okenye Juda na Jerusalem niile.
2CH 34:30 Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.
2CH 34:31 Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu Onyenwe anyị, ịgbaso Onyenwe anyị, na idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile rube isi nʼokwu ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ ahụ.
2CH 34:32 O mekwara ka ndị niile nọ na Jerusalem na Benjamin kwee Onyenwe anyị otu nkwa ahụ. Ndị niile bi na Jerusalem mezukwara ihe ndị a dịka ọgbụgba ndụ Chineke, bụ Chineke nna nna ha si dị.
2CH 34:33 Josaya sitere nʼala niile bụ nke ndị Izrel wezuga ihe arụ niile bụ arụsị, o mere ndị niile nọ nʼIzrel nʼoge ahụ ka ha fee Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Nʼụbọchị ndụ ya niile, ha esiteghị nʼiso Onyenwe anyị, bụ Chineke nke nna nna wezuga onwe ha.
2CH 35:1 Josaya mere Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị na Jerusalem nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ. Ha gburu atụrụ Mmemme Ngabiga nʼụbọchị ahụ
2CH 35:2 O debekwara ndị nchụaja nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, gbaa ha ume ka ha bidokwa ịrụ ọrụ ha.
2CH 35:3 Ọ sịrị ndị Livayị, bụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ndị na-emekwa ka ndị Izrel ghọta ihe, “Dọnyenụ igbe nsọ ahụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn, nwa Devid, bụ eze Izrel wuru. Unu ekwesịkwaghị ị na-ebugharị ya nʼubu unu ọzọ. Ugbu a jeerenụ Onyenwe anyị Chineke unu, na ndị ya Izrel ozi.
2CH 35:4 Kwadoonụ onwe unu nʼusoro ezinaụlọ unu nʼotu nʼotu, dịka ntụziaka ihe Devid, eze Izrel dere nʼakwụkwọ si dị, ya na nke Solomọn nwa ya si dịkwa.
2CH 35:5 “Werenụ ọnọdụ nʼebe nsọ unu na otu ndị Livayị, maka nkewa nke ezinaụlọ nna nna unu ha si dị, bụ ikwu ndị Izrel, ndị na-abụghị ndị nchụaja.
2CH 35:6 Gbuonụ atụrụ ngabiga ndị ahụ, doonụ onwe unu nsọ, doziekwaranụ ụmụnna unu ndị Izrel aja ha, ime dịka ihe Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu si dị.”
2CH 35:7 Josaya nyere ndị niile nọ nʼebe ahụ onyinye igwe ewu na atụrụ ọnụọgụgụ ya dị iri puku atọ, nke ha ga-eji chụọ aja Mmemme Ngabiga. O nyekwara ha puku oke ehi atọ site nʼakụ eze.
2CH 35:8 Ndịisi ya nyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị onyinye afọ ofufu. Otu a kwa, Hilkaya na Zekaraya, na Jehiel, ndị na-elekọta ụlọnsọ Chineke nyere ndị nchụaja puku ewu na atụrụ abụọ na narị isii, nyekwa ha narị oke ehi atọ, maka iji chụọ aja Ngabiga.
2CH 35:9 Ndị bụ ndị ndu nʼebo Livayị aha ha bụ Konanaya, na Shemaya, na Netanel, na nwanne ya Hashabaya, na Jeiel, na Jozabad, nyere ndị Livayị puku ewu na atụrụ ise, na narị oke ehi ise maka iji ha chụọ aja Ngabiga.
2CH 35:10 Mgbe e dozichara usoro ije ozi ahụ niile, ndị nchụaja weere ọnọdụ ha, ha na ndị Livayị nʼoke ọrụ ha nʼusoro dịka eze nyere nʼiwu.
2CH 35:11 Mgbe ahụ ndị Livayị gburu atụrụ ngabiga ahụ niile, were ọbara ha nye ndị nchụaja. Ha fesara ya nʼebe ịchụ aja mgbe ndị Livayị nọ na-agba anụ ndị ahụ akpụkpọ.
2CH 35:12 Ha kenyere ezinaụlọ ọbụla anụ ndị ahụ niile ka ha jiri nke ha ketara chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼusoro dịka e dere nʼime akwụkwọ Mosis. Otu a ka ha mekwara banyere ehi ndị ahụ.
2CH 35:13 Otu a kwa, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, ha hụrụ anụ aja ngabiga ahụ nʼọkụ, sie aja ndị dị nsọ nʼite, buputa ha ngwangwa kee ha ndị mmadụ niile.
2CH 35:14 Emesịa, ha kwadooro onwe ha ihe, ma kwadokwara ndị nchụaja, nʼihi na ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn, nọọrị na-achụ aja nsure ọkụ na abụba anụ ruo abalị. Ya mere, ndị Livayị ji kwadoro onwe ha ma kwadokwara ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn ihe.
2CH 35:15 Ndị ikwu Asaf ndị a, bụ ndị na-abụ abụ, nọkwa nʼọnọdụ ha nʼusoro dịka ihe Devid, na Asaf, na Heman, na Jedutun onye amụma eze nyere nʼiwu. Ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama ahapụghị ọnọdụ ha, nʼihi na ndị Livayị ibe ha doziri ihe debere ha.
2CH 35:16 Ya mere, e doziri ofufe niile nke Onyenwe anyị nʼotu ụbọchị ahụ, maka ime Mmemme Ngabiga na ịchụ aja nsure ọkụ niile nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, dịka eze Josaya nyere nʼiwu.
2CH 35:17 Ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ mere Mmemme Ngabiga nʼoge ahụ, meekwa mmemme achịcha ekoghị eko ụbọchị asaa.
2CH 35:18 E mebeghị Mmemme Ngabiga nʼụdị a nʼIzrel, site nʼụbọchị Samuel onye amụma, o nwebekwaghị eze Izrel ọbụla nke merela mmemme a dịka Josaya mere, ya na ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị Juda niile na ndị Izrel niile bụ ndị nọ nʼebe ahụ tinyere ndị Jerusalem.
2CH 35:19 Ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, ka e mere Mmemme Ngabiga a.
2CH 35:20 Emesịa, mgbe Josaya hazisịrị ihe nʼụlọnsọ ahụ, Neko eze Ijipt gbagoro ịga buo agha na Kakemish, nke dị nʼakụkụ osimiri Yufretis. Mgbe ahụ, Josaya pụkwara izute ya nʼagha.
2CH 35:21 Ma Neko zipụrụ ndị ozi bịara zie Josaya ozi, sị ya, “Olee esemokwu dị ugbu a nʼetiti mụ na gị, gị eze Juda? Ọ bụghị ibuso gị agha ka m bịara, kama ọ bụ naanị ụlọ mụ na ha nọ nʼagha. Chineke sịrị m ka m mee ngwa; ya mere, egbochikwala Chineke onye nọnyeere m, ka ọ ghara iji iwe bibie gị.”
2CH 35:22 Ma Josaya esiteghị nʼebe ọ nọ chigharịa, kama o nwogharịrị onwe ya, ka a ghara ịmata onye ọ bụ, maka ịga buso ya agha. O geghịkwa ntị na okwu ahụ eze Neko kwuru nke si nʼaka Chineke bịa, kama ọ pụrụ ibuso ya agha nʼala Megido.
2CH 35:23 Ma mgbe ndị nʼagba ụta gbatara eze, bụ Josaya ụta, eze gwara ndị ozi ya sị, “Bupunụ m, nʼihi na emerụọla m ahụ nʼebe ọ dị ukwuu.”
2CH 35:24 Ya mere, ha sitere nʼụgbọ agha ya bulie ya bubanye ya nʼime ụgbọ agha ọzọ, bulata ya na Jerusalem, ebe ọ nọ nwụọ. E liri ya nʼili nna nna ya ha, ndị Juda na Jerusalem niile ruuru ya uju.
2CH 35:25 Jeremaya bụụrụ Josaya abụ akwa, ruo taa ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ a iji na-echeta Josaya. Nke a ghọrọ omenaala nʼIzrel, e dekwara ya nʼakwụkwọ abụ akwa dị iche iche.
2CH 35:26 Ihe ndị ọzọ niile Josaya mere, na ọrụ ebere niile ọ rụrụ nʼusoro ihe e dere nʼiwu Onyenwe anyị,
2CH 35:27 na akụkọ ndụ ya site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ, ka e depụtara nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda.
2CH 36:1 Ndị ala ahụ kpọọrọ Jehoahaz, nwa nwoke Josaya mee ya eze na Jerusalem, nʼọnọdụ nna ya.
2CH 36:2 Jehoahaz gbara iri afọ abụọ na atọ mgbe o bidoro ịchị, ma ọ chịrị na Jerusalem ọnwa atọ.
2CH 36:3 Eze Ijipt chụdara ya site nʼọchịchị na Jerusalem, kwagide ndị Juda ka ha tụọra ya ụtụ narị talenti ọlaọcha na otu talenti ọlaedo.
2CH 36:4 Eze Ijipt mere Eliakịm, otu nwanne Jehoahaz, eze ndị Juda na Jerusalem. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma Neko duuru Jehoahaz nwanne nwoke Eliakịm gaa Ijipt.
2CH 36:5 Jehoiakim gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jerusalem. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke ya.
2CH 36:6 Nebukadneza eze Babilọn busoro ya agha, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nʼihi i duru ya gaa Babilọn.
2CH 36:7 Nebukadneza bukọkwaara efere na iko ọlaedo dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, buru ha gaa buba ha nʼụlọeze ya dị na Babilọn.
2CH 36:8 Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim, na banyere ihe arụ niile o mere, na ihe niile a chọpụtara megide ya, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2CH 36:9 Jehoiakin gbara afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị naanị ọnwa atọ na abalị iri na Jerusalem. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị.
2CH 36:10 Emesịa, nʼafọ nke ọzọ ya, Nebukadneza ziri ozi mee ka akpọrọ ya, na ọtụtụ ihe ndị dị oke ọnụahịa sitere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bulaa ha Babilọn nʼoge a. O mere nwanne nna Jehoiakin bụ Zedekaya, eze Juda na Jerusalem.
2CH 36:11 Zedekaya gbara iri afọ abụọ na otu mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jerusalem.
2CH 36:12 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke ya, o wedaghị onwe ya ala nara ndụmọdụ Jeremaya bụ onye amụma, onye na-ekwu okwu nke Onyenwe anyị.
2CH 36:13 Ọzọkwa, o nupuru isi megide eze Nebukadneza, onye mere ka ọ ṅụọ iyi nʼaha Chineke. Ọ ghọrọ onye isiike, onye mechiri obi ya, jụ ichigharịkwute Onyenwe anyị, Chineke Izrel.
2CH 36:14 Nʼime ka ihe dị njọ karịa, mmadụ niile, tinyere ndị ndu nʼetiti ndị nchụaja, nọgidere bụrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, site nʼịgbaso omenaala rụrụ arụ nke mba niile gbara ha gburugburu. Ha merụrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke o doro nsọ nʼime Jerusalem.
2CH 36:15 Onyenwe anyị, Chineke nna nna ha, sitere nʼọnụ ndị amụma ya gwa ha okwu mgbe na mgbe, ịdọ ha aka na ntị. O mere nke a nʼihi na o nwere obi ebere nʼebe ha nọ, na nʼebe ụlọnsọ ukwu ya dị.
2CH 36:16 Ma ha kwara ndị amụma Chineke ndị a emo, lelịa okwu Chineke ha wetara anya, chịa amụma ha buru ọchị, tutu ruo mgbe ha kpasuru ọnụma Onyenwe anyị megide ndị ya, ruo mgbe ihe ọbụla na-adịghịkwa nke pụrụ igbochi ngosipụta oke ọnụma a.
2CH 36:17 Ya mere, o welitara eze Kaldịa imegide ha, bụ onye ji mma agha gbuchapụ ụmụ okorobịa ha nʼụlọ ebe nsọ ha. O nweghịkwa ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa, maọbụ ụmụ agbọghọ dị, ndị okenye maọbụ ndị nrịa nrịa. Chineke weere ha niile nyefee ha nʼaka Nebukadneza.
2CH 36:18 O sitere nʼụlọnsọ ukwu Chineke kpokọrọ ihe niile dị nʼime ya, ma ihe ukwu ma ihe nta, tinyere akụ niile dị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, na nʼụlọeze, na nʼụlọ ndịisi ozi eze buru ha gaa Babilọn.
2CH 36:19 Ha sunyere ụlọnsọ Chineke ọkụ, kwatukwa mgbidi Jerusalem. Ha sunyere ụlọeze niile ọkụ, mebikwaa ihe niile ndị bara uru dị nʼime ya.
2CH 36:20 Ha buuru ndị fọdụrụ, bụ ndị niile gbanarịrị mma agha, gaa Babilọn, ha ghọrọ ya, ghọkwara ụmụ ya ndị nọchiri anya ya, ndị ohu, tutu ruo mgbe ehiwere alaeze Peshịa.
2CH 36:21 Ala ahụ nwere ụbọchị izuike niile kwesiri ya nʼebe o zuruoke, nʼoge niile nke ịtọgbọ nʼefu ya, o zuru ike, ruo mgbe iri afọ asaa ahụ zuru, nʼimezu okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma.
2CH 36:22 Ma nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị,
2CH 36:23 “Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru: “ ‘Onyenwe anyị, Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa. O nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga, ka Onyenwe anyị Chineke ha nọnyekwara ha.’ ”
EZR 1:1 Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị,
EZR 1:2 “Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru, “ ‘Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa, o nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda.
EZR 1:3 Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga Jerusalem nke dị na Juda, gaa wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel, bụ Chineke nọ na Jerusalem. Ka Chineke ha nọnyekwara ha.
EZR 1:4 Ma nʼobodo ọbụla ebe ndị fọdụrụ ndụ bi, ka ndị nọ nʼebe ahụ nye ha onyinye ọlaọcha na ọlaedo, na akụ na anụ ụlọ nʼụzọ enyemaka, tinyere onyinye afọ ofufu maka ụlọnsọ ukwu Chineke nke dị na Jerusalem.’ ”
EZR 1:5 Mgbe ahụ, Chineke tinyere ọchịchọ ịlaghachi Jerusalem nʼobi ndịisi ezinaụlọ Juda na Benjamin na ndị nchụaja, na ndị Livayị. Ha kwadokwara ịlaghachi maka ịrụ ọrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ na-atụfughị oge.
EZR 1:6 Ndị Juu bi na gburugburu Peshịa nyere ndị nke na-alaghachi Jerusalem onyinye ihe ọlaọcha na ọlaedo, na anụ ụlọ na ihe ndị ọzọ, na onyinye dị oke ọnụahịa dị iche iche, tinyere onyinye afọ ofufu ha.
EZR 1:7 Nke ka nke, eze Sairọs chịpụtara ọtụtụ ngwongwo nke ụlọnsọ Onyenwe anyị nke Nebukadneza sitere na Jerusalem bukọrọ gaa debe nʼụlọ chi ya.
EZR 1:8 Sairọs bụ eze Peshịa, chịpụtara ha site nʼaka Mitredat, onye bụ odozi akụ, onye gụrụ ha ọnụ nye Sheshbaza, onye bụ onyeisi ndị Juu ahụ na-alaghachi Jerusalem na Juda.
EZR 1:9 Nke a bụ ọnụọgụgụ ngwongwo ndị ahụ: efere ọlaedo iri atọ (30), efere ọlaọcha otu puku (1,000), efere ọlaọcha iri abụọ na itoolu (29),
EZR 1:10 efere nta ọlaedo iri atọ (30), efere ọlaọcha nta narị anọ na iri (410), ngwongwo ndị ọzọ otu puku (1,000).
EZR 1:11 Nʼime ihe ndị a niile, ọnụọgụgụ ihe e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ dị puku ise na narị anọ (5,400). Sheshbaza bulatara ihe ndị a mgbe ya na ndị ahụ a dọọrọ nʼagha hapụrụ Babilọn na-alọta Jerusalem.
EZR 2:1 Ugbu a, ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa Babilọn. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke ha.
EZR 2:2 Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Seraya, Reelaya, Mọdekai, Bilshan, Mispa, Bigvai, Rehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:
EZR 2:3 Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172).
EZR 2:4 Ụmụ Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ (372).
EZR 2:5 Ụmụ Ara, narị asaa na iri asaa na ise (775).
EZR 2:6 Ụmụ Pahat-Moab (site nʼụmụ Jeshua na Joab), dị puku abụọ na narị asatọ na iri na abụọ (2,812).
EZR 2:7 Ụmụ Elam, otu puku na narị abụọ na iri ise na anọ (1,254).
EZR 2:8 Ụmụ Zatu, narị itoolu na iri anọ na ise (945).
EZR 2:9 Ụmụ Zakai, narị asaa na iri isii (760).
EZR 2:10 Ụmụ Bani, narị isii na iri anọ na abụọ (642).
EZR 2:11 Ụmụ Bebai, narị isii na iri abụọ na atọ (623).
EZR 2:12 Ụmụ Azgad, otu puku na narị abụọ na iri abụọ na abụọ (1,222).
EZR 2:13 Ụmụ Adonikam, narị isii na iri isii na isii (666).
EZR 2:14 Ụmụ Bigvai, puku abụọ na iri ise na isii (2,056).
EZR 2:15 Ụmụ Adin, narị anọ na iri ise na anọ (454).
EZR 2:16 Ụmụ Atea, site na Hezekaya, iri itoolu na asatọ (98).
EZR 2:17 Ụmụ Bezai, narị atọ na iri abụọ na atọ (323).
EZR 2:18 Ụmụ Jora, otu narị na iri na abụọ (112).
EZR 2:19 Ụmụ Hashum, narị abụọ na iri abụọ na atọ (223).
EZR 2:20 Ụmụ Giba, iri itoolu na ise (95).
EZR 2:21 Ndị ikom Betlehem, otu narị na iri abụọ na atọ (123).
EZR 2:22 Ndị ikom Netofa, iri ise na isii (56).
EZR 2:23 Ndị ikom Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ (128).
EZR 2:24 Ndị ikom Azmavet, iri anọ na abụọ (42).
EZR 2:25 Ndị ikom Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ (743).
EZR 2:26 Ndị ikom Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu (621).
EZR 2:27 Ndị ikom Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ (122).
EZR 2:28 Ndị ikom Betel na Ai, narị abụọ na iri abụọ na atọ (223).
EZR 2:29 Ndị ikom Nebo, iri ise na abụọ (52).
EZR 2:30 Ndị ikom Magbish, otu narị na iri ise na isii (156).
EZR 2:31 Ụmụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254).
EZR 2:32 Ụmụ Harim, narị atọ na iri abụọ (320).
EZR 2:33 Ụmụ Lod, Hadid na Ono, narị asaa na iri abụọ na ise (725).
EZR 2:34 Ụmụ Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise (345).
EZR 2:35 Ụmụ Senaa, puku atọ, narị isii na iri atọ (3,630).
EZR 2:36 Ndị nchụaja: ndị agbụrụ Jedaya (site nʼezinaụlọ Jeshua), narị itoolu na iri asaa na atọ (973)
EZR 2:37 ndị Imea, otu puku na iri ise na abụọ (1,052)
EZR 2:38 ndị Pashua, otu puku na narị abụọ na iri anọ na asaa (1,247)
EZR 2:39 ndị Harim, otu puku, otu narị na asaa (1,107).
EZR 2:40 Ndị Livayị: Ndị agbụrụ Jeshua na Kadmiel (nke ụmụ Hodavaya), iri asaa na anọ (74).
EZR 2:41 Ndị ọbụ abụ: Ndị agbụrụ Asaf, otu narị, na iri abụọ na asatọ (128).
EZR 2:42 Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu: Ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai. Ha dị otu narị, na iri atọ na itoolu (139).
EZR 2:43 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ: Ndị agbụrụ Ziha, Hasufa na ndị Tabaot,
EZR 2:44 Keros, Siaha, Padon,
EZR 2:45 Lebana, Hagaba, Akub,
EZR 2:46 Hagab, Shalmai, Hanan,
EZR 2:47 Gidel, Gaha, Reaya,
EZR 2:48 Rezin, Nekoda, Gazam,
EZR 2:49 Ụza, Pasea Besai,
EZR 2:50 Asna, Meunim, Nefusim,
EZR 2:51 Bakbuk, Hakufa, Hahua,
EZR 2:52 Bazlut, Mehida, Hasha,
EZR 2:53 Bakos, Sisera, Tema,
EZR 2:54 Nezaya na Hatifa.
EZR 2:55 Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Hasoferet, Peruda,
EZR 2:56 Jaala, Dakon, Gidel
EZR 2:57 Shefataya, Hatil, na Pokeret-Hazebaim na Ami.
EZR 2:58 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ (392).
EZR 2:59 Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.
EZR 2:60 Ndị agbụrụ Delaya, Tobaya na Nekoda, narị isii na iri ise na abụọ (652).
EZR 2:61 Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ Hobaya, Hakoz na Bazilai, nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead, a kpọọ ya aha nʼaha ha.
EZR 2:62 Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha, nʼihi ya, e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.
EZR 2:63 Onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe dịkarịsịrị nsọ tutu ruo mgbe e nwere onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.
EZR 2:64 Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ, na iri isii (42,360),
EZR 2:65 nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ (200).
EZR 2:66 Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ebe ịnyịnya muul dị narị abụọ na iri anọ na ise (245).
EZR 2:67 Ịnyịnya kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa, na iri abụọ (6,720).
EZR 2:68 Mgbe ha bịarutere nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye afọ ofufu maka i ji rụzie ụlọ Chineke ka o guzo nʼọnọdụ ya.
EZR 2:69 Onye ọbụla nʼime ha webatara nʼụlọakụ ihe o nwere ike inye nʼihi ọrụ a. Ha nyere darik ọlaedo dị puku iri isii na otu (61,000), maịna ọlaọcha dị puku ise (5,000) na onyinye uwe ndị nchụaja, otu narị (100).
EZR 2:70 Ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị na-eche ọnụ ụzọ ama, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ ọzọkwa, ha na ndị Izrel niile fọdụrụ gara biri nʼobodo nke aka ha.
EZR 3:1 Mgbe o ruru ọnwa asaa nʼafọ, ndị Izrel nọkwa nʼobodo ha niile, ndị mmadụ zukọtara nʼotu na Jerusalem.
EZR 3:2 Mgbe ahụ, Jeshua, nwa Jozadak na ndị nchụaja ndị ọzọ, na Zerubabel nwa Shealtiel na ndị na-enyere ya aka malitere iwugharị ebe ịchụ aja Chineke Izrel maka ịchụ aja nsure ọkụ nʼelu ya dịka Mosis onye nke Chineke si nye nʼiwu.
EZR 3:3 Nʼagbanyeghị oke egwu maka ndị niile gbara ha gburugburu, ha gara nʼihu wughachikwa ebe ịchụ aja ahụ na ntọala ya chụọkwa aja nʼelu ya nye Onyenwe anyị, bụ aja nsure ọkụ nke ụtụtụ na nke uhuruchi.
EZR 3:4 Ha mekwara mmemme ụlọ Ikwu dịka e dere ya nʼiwu Mosis, chụọkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nʼụbọchị niile nke mmemme ahụ.
EZR 3:5 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha chụrụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ mgbe niile, na nke aja maka ọnwa ọhụrụ, na aja ndị ọzọ maka mmemme ndị ọzọ dị nsọ a kara aka nke Onyenwe anyị. Ha chụkwara aja onyinye nke ha ji nye Onyenwe anyị onyinye afọ ofufu.
EZR 3:6 Ndị nchụaja bidoro ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼabalị mbụ nke ọnwa nke asaa. Ọ bụ ezie na a tọbeghị ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
EZR 3:7 Ha nyere ndị ọrụ na-edo nkume na ndị ọkpọ ǹtu ego, nyekwa ndị Saịdọn na ndị Taịa ihe oriri, na ihe ọṅụṅụ na mmanụ oliv, ka ha nwee ike isite nʼosimiri Lebanọn budata osisi sida ndị ahụ rute Jopa, dịka ikike Sairọs bụ eze Peshịa si kwadoo ya.
EZR 3:8 Nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ site mgbe ha bịarutere nʼụlọ Chineke na Jerusalem. Mmadụ niile ahụ lọtara Juda so rụọ ọrụ. Zerubabel nwa Shealtiel, Jeshua nwa Jozadak na ndị fọdụrụ na ụmụnne ha, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị niile si na ndọta nʼagha lọta Jerusalem, malitere ịrụ ọrụ ahụ. Ha họpụtara ndị Livayị niile gbara iri afọ abụọ rigoo ka ha lekọta ihe banyere ọrụ ụlọ Onyenwe anyị.
EZR 3:9 Jeshua na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụnne ya, Kadmiel na ụmụ ya, ndị si nʼikwu Hodavaya, ha na ụmụ Henadad na ụmụ ha, na ụmụnna ha, ha niile bụ ndị Livayị, jikọtara aka na-elekọta ndị na-arụ ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ.
EZR 3:10 Mgbe ndị na-ewu ụlọ tọrọ ntọala ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ, ndị nchụaja ahụ niile yii uwe ha jide opi nʼaka. Otu a kwa ndị Livayị, ụmụ ndị ikom Asaf jikwa ogene ha na-eto Onyenwe anyị dịka usoro iwu Devid, eze Izrel nyere ha si dị.
EZR 3:11 Ha ji abụ otuto na ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ sị: “Ọ dị mma, ịhụnanya ya nʼebe Izrel nọ na-adị ruo ebighị ebi.” Mmadụ niile jiri oke olu too Onyenwe anyị nʼihi ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ ha tọrọ.
EZR 3:12 Ma ụfọdụ ndị merela agadi nʼetiti ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị ndu nke ikwu dị iche iche, bụ ndị chetara ụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn wuru, kwara akwa hie nne, mgbe ndị ọzọ nọ na-eti mkpu ọṅụ.
EZR 3:13 Ya mere, e sitere nʼebe dị nnọọ anya nụ ụzụ ọṅụ na ụda akwa ndị mmadụ ahụ. Ma o nweghị onye nwere ike ịkọwata nke bụ mkpu akwa maọbụ mkpu ọṅụ, nʼihi na ụzụ ahụ dị ukwuu.
EZR 4:1 Mgbe ndị iro Juda na Benjamin nụrụ na ndị ahụ a dọtara nʼagha alọtala, nụkwa na ha na-ewugharị ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, Chineke Izrel,
EZR 4:2 ha bịakwutere Zerubabel na ndịisi ezinaụlọ sị ha, “Kwerenụ ka anyị nyere unu aka nʼọrụ iwu ụlọ a, nʼihi na anyị hụrụ Chineke unu nʼanya dịka unu onwe unu si hụ ya nʼanya. Lee na kemgbe Isahadon eze Asịrịa butere anyị nʼebe a, anyị alabeghị azụ ịchụrụ ya aja.”
EZR 4:3 Ma Zerubabel, na Jeshua na ndịisi ọzọ zara sị ha, “Unu enweghị oke ọbụla nʼọrụ iwuru Chineke anyị ụlọnsọ. Naanị ndị anyị ga-ewuru Onyenwe anyị, Chineke Izrel ụlọ ukwu a dịka Sairọs eze Peshịa nyere nʼiwu.”
EZR 4:4 Ya mere ndị niile nọ ha gburugburu malitere ime ihe ga-ewetara ndị Juda ịda mba nʼobi, na ihe ga-eme ka ụjọ tụọ ha ịga nʼihu nʼọrụ iwu ụlọ ahụ.
EZR 4:5 Ha ji ngarị gota ụfọdụ ndịisi ka ha megide ha, mebikwaa atụmatụ ha niile nʼoge niile Sairọs bụ eze Peshịa, ruokwa nʼoge Daraiọs ghọrọ eze ọhụrụ Peshịa.
EZR 4:6 Na mmalite ọchịchị Sekses, ha deere ya akwụkwọ ebubo megide ndị Juda na Jerusalem.
EZR 4:7 Nʼụbọchị niile ahụ Ataksekses bụ eze ndị Peshịa, ka Bishlam, na Mitredat, na Tabeel, na ndị otu ya fọdụrụ degaara Ataksekses akwụkwọ. E dere akwụkwọ ozi ahụ nʼodide akwụkwọ ndị Aramaik, a sụgharịkwara ya nʼasụsụ Aramaik.
EZR 4:8 Ndị ọzọ soro ha gbaa ajọ izu a bụ Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ. Ha deere Ataksekses akwụkwọ megide ndị Jerusalem sị ya:
EZR 4:9 “Akwụkwọ ozi a si nʼaka Rehum, onyeisi agha na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu anyị ndị ọzọ, na ndị ikpe, na ndịisi obodo na-elekọta ndị ahụ niile si Tripolis, na Peshịa, na Erek, na Babilọn, na Susa nke dị nʼElam,
EZR 4:10 na ọtụtụ ndị ọzọ ahụ onye ukwu ahụ na onye a na-asọpụrụ bụ Ashobanipal si nʼala ha bupụ bute na Sameria, na obodo ndị ọzọ dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis.”
EZR 4:11 Nke a bụ ihe ha dere nʼakwụkwọ ha zigaara Eze Ataksekses. Ọ bụ gị, eze ukwu Ataksekses, ka ndị ohu gị bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis na-edetara akwụkwọ a.
EZR 4:12 Nke a bụ ime ka ị mata na ndị Juu si Babilọn lọta Jerusalem ọhụrụ a ebidola iwughachi obodo ọjọọ nke nnupu isi ahụ. Ha ewuolarị mgbidi ya, tọkwaa ntọala ya.
EZR 4:13 Anyị chọrọ ka o doo gị anya na ọ bụrụ na ha ewuchaa ya, ọ ga-abụ nsogbu nye alaeze gị, nʼihi na ndị Juu agaghị ekwekwa ịtụrụ gị ụtụ isi ha.
EZR 4:14 Ebe anyị na-asọpụrụ gị dịka nna anyị ukwu, anyị achọghị ka ihe ọjọọ mee nʼalaeze gị, ya mere anyị ji kpebie idere gị akwụkwọ a.
EZR 4:15 Anyị chọrọ ka i leba anya nʼakwụkwọ akụkọ nke mgbe ochie, ka ị chọpụta na ọ dịghị mgbe Jerusalem na-ejighị bụrụ obodo nnupu isi. Nʼezie, ọ bụ nʼihi nnupu isi a na nkwulu nke ha na-ekwulu ndị eze dị iche iche, ka e ji bibie ya na mbụ.
EZR 4:16 Anyị chọrọ ka ị mata na ọ bụrụ na e wuchaa mgbidi obodo a, ọ ga-esi ike ka akụkụ alaeze gị a, nke dị ruo nʼosimiri Yufretis, bụrụkwa nke gị ọzọ.
EZR 4:17 Eze ahụ si otu a saa akwụkwọ ahụ, Ọ sịrị ha, Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu ha bi na Sameria ruo nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis. Ndeewonụ.
EZR 4:18 Akwụkwọ ozi ahụ unu zitere anyị, agụọla ma tapịakwaa ya nʼihu m.
EZR 4:19 Enyere m iwu ka e nyochaa chọpụta, e mere nyochaa, a chọpụtakwara ya nʼakwụkwọ na obodo a siterị nʼoge gara aga bụ obodo na-ebuli onwe ya megide ọtụtụ ndị eze, bụrụkwa ebe na-akpali nnupu isi na okwu na-eweta ọgbaaghara.
EZR 4:20 Jerusalem e nweela ụfọdụ ndị eze nke chịrị nʼIzrel, ndị dị ike a maara aha ha, ndị alaeze ha gbasara rute nʼosimiri Yufretis, ndị a na-atụkwara ụtụ dị iche iche.
EZR 4:21 Ugbu a, nye iwu ka ndị ikom ndị ahụ kwụsị ọrụ, ka a ghara iwuzi obodo a tutu ruo mgbe m ga-enye iwu.
EZR 4:22 Lezienụ anya ka unu ghara i lepụrụ okwu a anya. Gịnị ga-eme ka a hapụ ihe iyi egwu a ka ọ gaa nʼihu, ime ka ihe jọrọ alaeze a njọ karịa?
EZR 4:23 Ngwangwa a gụrụ akwụkwọ ozi si nʼaka eze Ataksekses, nye Rehum na Shimshai bụ ode akwụkwọ, na ndị otu ha, ha mere ọsịịsọ gakwuru ndị Juu na Jerusalem jiri ike kwagide ha ka ha kwụsị ịrụ ọrụ ahụ.
EZR 4:24 Ya mere, ha kwụsịrị ịrụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke na Jerusalem tutu ruo nʼafọ abụọ nke ọchịchị Daraiọs eze Peshịa.
EZR 5:1 Ugbu a, ndị amụma, bụ Hegai, na Zekaraya nwa Ido buru amụma nye ndị Juu nọ na Juda nakwa Jerusalem. Ọ bụ nʼaha Chineke nke Izrel, onye na-achị ha ka ha buru amụma ahụ.
EZR 5:2 Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak malitekwara iwu ụlọnsọ Chineke nʼJerusalem. Ndị amụma Chineke ahụ nọnyeere ha na-enyekwara ha aka.
EZR 5:3 Ma Tatenai, onye na-achị mba niile dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndị enyi ha, gara Jerusalem jụọ ndị Juu sị; “Onye nyere unu ike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem?”
EZR 5:4 Ha jụkwara ha ajụjụ sị: “Gịnị bụ aha ndị na-arụ ụlọ a?”
EZR 5:5 Ma anya Chineke ha dịkwasịrị nʼahụ ndị okenye ndị Juu, ha akwụsịghị ha ọrụ ruo mgbe akwụkwọ ozi ruru Daraiọs, na mgbe ọsịsa ya bịara site nʼakwụkwọ ozi.
EZR 5:6 Nke a bụ akwụkwọ ozi Tatenai, onye na-achị ala dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ degara eze Daraiọs:
EZR 5:7 Ha zigara ya akwụkwọ ozi, nke e si otu a dee, Daraiọs bụ eze nwe akwụkwọ a, Anyị ekelee gị.
EZR 5:8 Ọ dị mma ka eze mata na anyị jeruru mpaghara ala Juda, nʼebe ahụ ụlọnsọ ukwu Chineke dị. Anyị chọpụtara na ndị ahụ ji nkume a wara awa na-ewu ya, na-edokwa osisi na-elu mgbidi ya. Ọrụ ahụ na-agakwa nʼihu nke ọma na-esepụghị aka nʼokpuru nlekọta ha.
EZR 5:9 Anyị jụrụ ndị okenye ajụjụ sị: Onye nyere unu ikike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem?
EZR 5:10 Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị si otu a mee ka ị mata aha ndị ndu ha.
EZR 5:11 Ma nke a bụ ihe ha zaghachiri anyị: “Anyị onwe anyị bụ ndị ohu Chineke nke eluigwe na ụwa. Anyị na-ewugharị ụlọnsọ nke otu eze ukwu ndị Izrel wuru nʼoge gara aga.
EZR 5:12 Ma nʼihi na nna nna anyị ha mere ka iwe wee Chineke nke eluigwe, o weere ha nyefee nʼaka Nebukadneza, onye Kaldịa, bụ eze Babilọn, onye bibiri ụlọnsọ a ma dọrọ ndị bi nʼala ahụ nʼagha laa Babilọn.
EZR 5:13 “Ma otu ọ dị, nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Babilọn, eze Sairọs nyere iwu ka e wugharịa ụlọnsọ Chineke a.
EZR 5:14 O sikwa nʼụlọnsọ dị na Babilọn wepụta ngwongwo ọlaọcha na ọlaedo si nʼụlọnsọ Chineke nke Nebukadneza si nʼụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem bupụ bulaa nʼụlọnsọ dị na Babilọn. Mgbe ahụ eze Sairọs nyefere ha nʼaka otu nwoke a na-akpọ Sheshbaza, onye ọ họpụtara dịka gọvanọ.
EZR 5:15 Ọ gwara ya sị, ‘buru ngwongwo ndị a bulaa ha nʼụlọnsọ dị na Jerusalem, wugharịakwa ụlọnsọ Chineke nʼọnọdụ ya mbụ.’
EZR 5:16 “Ya mere, ọ bụ Sheshbaza a bịara tọọ ntọala ụlọnsọ dị na Jerusalem. Sitekwa nʼoge ahụ ruo ugbu a, ha nọ na-arụ ya ma ha arụchabeghị ya.”
EZR 5:17 Ugbu a, ọ bụrụ na ọ dị eze mma nʼobi, ya nye iwu ka e nyochaa nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị eze Babilọn, ịchọpụta maọbụ eziokwu na eze Sairọs nyere iwu dị otu a iwugharị ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem. Ka eze gwakwa anyị ihe bụ mkpebi ya banyere okwu a.
EZR 6:1 Ya mere, Daraiọs nyere iwu ka a chọpụta nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị Babilọn ma ọ dị akwụkwọ ọbụla dị otu ahụ.
EZR 6:2 Emesịa, a chọpụtara otu akwụkwọ nʼụlọeze dị na Ekbatana nʼala Midia. Nke a bụ ihe e dere nʼime akwụkwọ ahụ: Akwụkwọ ozi eze;
EZR 6:3 Nʼafọ mbụ nke Sairọs bụ eze, o nyere iwu banyere ụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ebe ndị Juu na-efe Chineke. A ga-ewughachi ụlọnsọ ukwu ahụ ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja, ka a tọsiekwa ntọala ya ike. Ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-abụkwa otu ihe ahụ.
EZR 6:4 Ahịrị atọ nke oke nkume ka a ga-eji tọọ ntọala ya, tinyere otu ahịrị osisi. A ga-esi nʼụlọakụ eze Sairọs kwụọ ụgwọ ihe ndị a niile.
EZR 6:5 Ọzọkwa, a ga-ebughachikwa ngwongwo ọlaedo na ọlaọcha niile nke ụlọ Chineke, ndị Nebukadneza sitere nʼụlọnsọ ahụ dị nʼJerusalem buru gaa Babilọn, doghachikwa ha nʼụlọ Chineke.
EZR 6:6 Mgbe a gụsịrị ya, Daraiọs zighachiri Tatenai onye na-achị Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ nọ nʼọdịda anyanwụ Yufretis ozi sị ha, Unu hapụ ha ka ha rụọ ọrụ ha.
EZR 6:7 Unu egbochila owuwu ụlọ Chineke ahụ. Kwerenụ ka onyeisi ndị Juu na ndị okenye Juu wughachi ụlọ Chineke a nʼebe e wuru ya na mbụ.
EZR 6:8 Ọzọ, ana m enye iwu na nke a bụ ihe unu na-aghaghị imere ndị okenye, na ndị Juu niile na-ewugharị ụlọnsọ Chineke ahụ. Ka unu site nʼụtụ isi a na-atụrụ m kwụọ ụgwọ e ji ewu ụlọ ahụ na-atụfughị oge ọbụla.
EZR 6:9 Unu nye ha ihe ọbụla dịkwa ha mkpa, ụmụ oke ehi na ebule, ụmụ atụrụ, ha ga-eji chụọrọ Chineke nke eluigwe aja. Nyekwanụ ha ọka wiiti, na mmanya, na nnu, na mmanụ oliv, dịka ndị nchụaja rịọrọ, bụ ndị nọ na Jerusalem, aghaghị inye ha ihe ndị a kwa ụbọchị niile na-esepụghị aka.
EZR 6:10 Ka ha nwee ike ịchụ ezi aja nye Chineke nke eluigwe, kpeekwaara mụ na ụmụ m ekpere.
EZR 6:11 Ana m enye iwu na onye ọbụla ga-agbanwe okwu a, ka ehopụta osisi nʼụlọ ya jiri kwụgbuo ya. A ga-emekwa ụlọ ya ka ọ bụrụ ebe ikpofu ahịhịa.
EZR 6:12 Chineke ahụ, onye mere Jerusalem ebe obibi ya, ga-ebibi eze ọbụla maọbụ mba ọbụla gbanwere iwu a, maọbụ bibie ụlọnsọ ahụ ọzọ. Ọ bụ Daraiọs na-enye iwu a. Ka onye ọbụla were ike ya niile debe ya.
EZR 6:13 Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze Daraiọs zitere, Tatenai, onyeisi ọchịchị nʼala ofe mmiri, na Sheta Bozenai, na ndị otu ha, mere ihe niile dịka ozi ahụ si dị na-atụfughị oge ọbụla.
EZR 6:14 Nʼihi ya, ndịisi Juu gara nʼihu nʼọrụ, ihe na-agakwara ha nke ọma site na nkwusa onye amụma, bụ Hegai, na Zekaraya, nwa Ido. Ha wuchara ụlọnsọ ahụ dịka iwu Chineke Izrel nyere si dị, nakwa dịka Sairọs, na Daraiọs, na Ataksekses, ndị eze Peshịa, nyekwara nʼiwu.
EZR 6:15 Ha wusiri ya nʼabalị nke atọ nʼọnwa isii (dị ka ọgụgụ afọ ndị Juu si dị) nʼafọ nke isii nke ọchịchị Daraiọs.
EZR 6:16 Ụmụ Izrel, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị fọdụrụ nʼime ndị e mere ka ha ga biri nʼala ọzọ, ji ọṅụ mee mmemme nke ido ụlọ nke Chineke ahụ nsọ na gbaghee ya.
EZR 6:17 Nʼihi ido ụlọ ahụ nsọ, ha ji oke ehi dị otu narị nʼọnụọgụgụ, na narị ebule abụọ, na narị atụrụ anọ chụọ aja, werekwa mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile, dịka ebo niile nke Izrel si dị.
EZR 6:18 Ha guzobere ndị nchụaja na nkewa ha, ndị Livayị nʼotu ha maka ije ozi nke Chineke na Jerusalem, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis.
EZR 6:19 Ndị ahụ emere ka ha gaa biri nʼala ọzọ, mere Mmemme Ngabiga nʼabalị iri na anọ nke ọnwa mbụ.
EZR 6:20 Ndị nchụaja na ndị Livayị edoola onwe ha ọcha, ha niile dịkwa ọcha. Ndị Livayị nʼonwe ha gburu ọtụtụ atụrụ Mmemme Ngabiga maka ndị nchụaja, na ndị Livayị ndị ọzọ, na ndị ahụ niile lọtara alọta site na mba ọzọ.
EZR 6:21 Ya mere, ndị Izrel niile bụ ndị ahụ lọtara site nʼebe e mere ka ha gaa biri riri ihe ahụ, ha na ndị ahụ niile kewapụrụ onwe ha juu ibi ajọọ ndụ nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na-ebi, nʼihi ịchọ Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel.
EZR 6:22 Ha sokwa mee mmemme achịcha na-ekoghị eko, nke ha mere ụbọchị asaa. Oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile nʼihi na Onyenwe anyị mere ka eze Asịrịa nwee obiọma nʼebe Izrel nọ, nyere ha aka iwugharị ụlọnsọ ukwu Chineke, onye bụ Chineke Izrel.
EZR 7:1 Mgbe nke a gasịrị, nʼoge ọchịchị Ataksekses bụ eze Peshịa. Ezra bụ nwa Seraya nwa Azaraya, Azaraya nwa Hilkaya,
EZR 7:2 bụ nwa Shalum, nwa Zadọk, nwa Ahitub,
EZR 7:3 nwa Amaraya, nwa Azaraya, nwa Meraiot,
EZR 7:4 Meraiot nwa Zerahaya; Zerahaya nwa Uzi, Uzi nwa Buki;
EZR 7:5 Buki nwa Abishua, Abishua nwa Finehaz; Finehaz nwa Elieza, Elieza nwa Erọn onyeisi nchụaja.
EZR 7:6 Ezra a si Babilọn bịarute. Ọ bụ onye ọka nʼihe gbasara iwu ahụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel nyere Mosis. Eze nyere ya ihe niile nke ọ rịọrọ, nʼihi na aka Onyenwe anyị Chineke ya dịkwasịrị nʼahụ ya.
EZR 7:7 Ụfọdụ ndị Izrel, ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị nche na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, soro ya jee Jerusalem nʼafọ asaa nke ọchịchị eze Ataksekses.
EZR 7:8 Ezra bịaruru Jerusalem nʼọnwa nke ise, nke afọ asaa nke ọchịchị eze.
EZR 7:9 Ọ hapụrụ Babilọn nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ, rute Jerusalem nʼabalị mbụ nke ọnwa ise nʼihi na Chineke nọnyeere ya.
EZR 7:10 Nke a mere nʼihi na Ezra kpebiri nʼobi ya ịmụ, na idebe iwu Onyenwe anyị, na ịbụ onye ozizi nke okwu Chineke nye ụmụ Izrel.
EZR 7:11 Nke a bụ ndepụta akwụkwọ ozi eze, bụ Ataksekses degaara Ezra onye nchụaja, na onye ozizi, na onye ọka nʼihe gbasara iwu na ụkpụrụ nke Onyenwe anyị nyere Izrel:
EZR 7:12 Ataksekses, eze na-achị ndị eze ọzọ, na-edegara Ezra akwụkwọ, bụ onye nchụaja, bụrụkwa onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe. Ndeewo!
EZR 7:13 Ugbu a, ana m enye iwu ka onye Izrel ọbụla bi nʼalaeze m, ma ndị nchụaja, na ndị Livayị, ndị wepụtara onwe ha ị soro gị gaa Jerusalem, ha nwere ike ịga.
EZR 7:14 Eze na mmadụ asaa ndị na-adụ ya ọdụ na-eziga gị Juda na Jerusalem ka ị gaa leba anya nʼiwu Chineke nke dị gị nʼaka.
EZR 7:15 Ọzọkwa, ịga e were onyinye ọlaedo na ọlaọcha ndị a eze na ndị ndụmọdụ ya ji afọ ofufu nye Chineke nke Izrel, onye ebe obibi ya dị na Jerusalem.
EZR 7:16 Tinyere ọlaedo na ọlaọcha nke i nwere ike ịnata nʼala ahụ niile nʼakụkụ niile nke Babilọn, tinyekwara onyinye ihuọma si nʼaka ndị mmadụ, na ndị nchụaja niile, maka ụlọnsọ ukwu Chineke ha dị na Jerusalem.
EZR 7:17 Ị ga-eji ego niile ndị a zụọ oke ehi, na ebule, na atụrụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ, e ji achụ aja nʼebe ịchụ aja nke ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem.
EZR 7:18 Ọ bụrụ na ego amapụta nʼime ya, gị na ụmụnne gị ga-eji ya mee ihe unu maara bụ uche Chineke unu.
EZR 7:19 Ngwongwo niile e bunyere gị maka ije ozi nʼụlọnsọ Chineke, buru ha buruo nʼihu Chineke nke Jerusalem.
EZR 7:20 Ma ihe ndị ọzọ nke fọdụrụ nʼihi ụlọnsọ Chineke gị, nke kwesiri na i mere, ị nwere ike site nʼụlọakụ eze mee ha.
EZR 7:21 Mụ, bụ Ataksekses, na-eziga iwu a nye ndị na-elekọta ego nʼọdịda anyanwụ osimiri Yufretis sị ha, ihe ọbụla Ezra, onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe chọrọ site nʼaka unu, unu nye ya.
EZR 7:22 Ọ bụladị ruo ọlaọcha dị otu narị talenti, ya na narị akpa ọka wiiti ise, na narị galọọnụ mmanya vaịnị isii, na narị efa nke mmanụ oliv na nnu nʼọtụtụ ọbụla, dịka ọ chọrọ ya.
EZR 7:23 Ihe ọbụla ọzọ, nke Chineke nke eluigwe chọrọ, ka e mee ha nʼụzọ kwesiri nye maka owuwu ụlọnsọ Chineke nke eluigwe. Nʼihi gịnị ka iwe Chineke ga-eji dakwasị eze na ụmụ ya ndị ikom?
EZR 7:24 Ana m enyekwa iwu na ndị nchụaja niile, ndị Livayị niile, ndị ọbụ abụ niile, ndị nche niile, ndị ozi ụlọnsọ niile, na ndị ọzọ niile na-arụrụ Chineke ọrụ, agaghị atụ ụtụ ọbụla.
EZR 7:25 “Ugbu a, Ezra, ị ga-eji amamihe Chineke gị nyere gị họpụta ndị ikpe, na ndịisi, ndị ga-achị obodo niile dị nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis. Ọ bụrụ na ha amazighị iwu Chineke nke ọma, ị ga-akụziri ha.
EZR 7:26 Ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla jụrụ idebe iwu Chineke, na iwu eze, ga-abụ ọnwụ, maọbụ nchụpụ site nʼala ya gaa mba ọzọ, maọbụ ịnakọrọ ya ihe niile o nwere, maọbụ ịtụba ya nʼụlọ mkpọrọ.”
EZR 7:27 Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke nna nna anyị ha, onye mere ka eze kpebie ime ka ụlọnsọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem dị mma ile anya.
EZR 7:28 Keleekwa Chineke onye nyere m ihuọma nʼihu ndị ndụmọdụ ya, na nʼihu ụmụ eze, bụ ndịisi ọchịchị dị ike. Nʼihi na aka Onyenwe anyị Chineke m nọnyeere m. Eji m obi ike chịkọta ndịisi site nʼIzrel ka ha soro m gaa.
EZR 8:1 Ndị a bụ usoro ọmụmụ ndịisi ezinaụlọ ahụ niile sooro m site na Babilọn laghachi mgbe Ataksekses bụ eze:
EZR 8:2 ndị ikwu Finehaz, Geshọm; ndị ikwu Itama, Daniel; ndị ikwu Devid, Hatush
EZR 8:3 ndị ikwu Shekanaya; ndị ikwu Parosh, Zekaraya na narị mmadụ na iri ise (150) ndị so ya denye aha ha nʼakwụkwọ.
EZR 8:4 Ndị ikwu Pahat-Moab, Eliehoenai nwa Zerahaya dị narị mmadụ abụọ (200),
EZR 8:5 ndị ikwu Zatu, Shekanaya nwa Jahaziel na narị mmadụ atọ (300) so ya.
EZR 8:6 Ndị ikwu Adin, Ebed nwa Jonatan na iri mmadụ ise (50) so ya.
EZR 8:7 Ndị sitere nʼikwu Elam, Jeshaya nwa Atalaya, na iri ndị ikom asaa (70),
EZR 8:8 ndị sitere nʼikwu Shefataya, Zebadaya nwa Maikel, na iri ndị ikom asatọ (80).
EZR 8:9 Ndị sitere nʼikwu Joab, Ọbadaya nwa Jehiel na narị ndị ikom abụọ na iri na asatọ (218),
EZR 8:10 ndị sitere nʼikwu Bani, Shelomit nwa Josifaya na narị ndị ikom na iri isii (160).
EZR 8:11 Ndị sitere nʼikwu Bebai; Zekaraya nwa Bebai na ndị ikom iri abụọ na asatọ (28),
EZR 8:12 ndị sitere nʼikwu Azgad, Johanan nwa Hakatan na narị ndị ikom na iri (110).
EZR 8:13 Ndị sitere nʼikwu Adonikam, ndị ikpeazụ, ndị aha ha bụ Elifelet, na Jeuel na Shemaya na iri ndị ikom isii (60) bụ ndị so ha,
EZR 8:14 ndị sitere nʼikwu Bigvai, Utai na Zakua na iri ndị ikom asaa (70) bụ ndị so ha.
EZR 8:15 Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼAhava, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye Livayị nọ nʼebe ahụ.
EZR 8:16 Mgbe ahụ, ezigara m ozi kpọọ Elieza, Ariel, Shemaya, Elnatan, Jarib, Elnatan, Netan, Zekaraya na Meshulam, ndị bụ ndịisi. Ezikwara m ozi kpọọ Joiarib na Elnatan, bụ ndị maara ihe.
EZR 8:17 Enyere m ha iwu ka ha gakwuru Ido, onyendu nọ na Kasifia. Agwara m ha ihe ha ga-agwa Ido na ndị Livayị ibe ya, bụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ dị na Kasifia, ka ha zite ndị ga-eje ozi ka ha bịakwute anyị maka ụlọnsọ Chineke.
EZR 8:18 Chineke gosikwara anyị obiọma zitere anyị nwoke a na-akpọ Sherebaya na ụmụ ya, na ụmụnne ya, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri na asatọ (18). Sherebaya bụ nwa Mahali, nwa Livayị nwa Izrel, bụrụkwa nwoke nwere ezi uche.
EZR 8:19 Chineke sitere nʼikwu Merari zite Hashabaya, na Jeshaya, tinyere ụmụnne ya na ụmụ ha ndị ikom, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri ndị ikom abụọ (20).
EZR 8:20 Ha zitekwara narị abụọ na iri abụọ (220) site na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ. Otu nke Devid na ndịisi ya họpụtara hiwee, maka inyere ndị Livayị aka. E deturu aha ha niile nʼotu nʼotu.
EZR 8:21 Nʼebe ahụ, ka m nọ kpọsaa obubu ọnụ nʼakụkụ osimiri Ahava, nʼihi iweda onwe anyị ala nʼihu Chineke anyị, na ịrịọ ya ka o duo anyị, ụmụ anyị na akụ anyị niile, nʼụzọ ziri ezi nʼije anyị, ma nọnyekwara anyị.
EZR 8:22 Nʼihi na ihere ekweghị m rịọ eze ka o dunyere anyị ndị agha, na ndị na-agba ịnyịnya ga-edu anyị, ichebe anyị nʼụzọ, site nʼaka ndị iro. Nʼihi na anyị agwalarị eze na Chineke, onye anyị na-efe, na-echebe ndị niile na-efe ya; gwakwa ya na oke iwe ya na-adakwasị ndị niile gbakụtara ya azụ.
EZR 8:23 Ya mere, anyị buru ọnụ, kpee ekpere, rịọ Chineke ka o chebe anyị. O chebekwara anyị.
EZR 8:24 Ahọpụtara m ndị nchụaja iri na abụọ ndị a: Sherebaya, Hashabaya na mmadụ iri ndị ọzọ bụ ụmụnna ha ka ha hụ maka ọlaọcha, na ọlaedo, na efere ọlaedo ahụ, na ihe ndị ọzọ ahụ eze na ndị na-adụ ya ọdụ, na ndịisi ọchịchị ya, na ụmụ Izrel niile nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke anyị.
EZR 8:25 Eji m ihe ọtụtụ tụọ onyinye ọlaọcha na ọlaedo na ihe ndị ọzọ eze, na ndị ndụmọdụ ya, na ndịisi ozi ya, na ndị Izrel nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke.
EZR 8:26 E jiri m ihe ọtụtụ tụnye ha ọlaọcha dị narị talenti isii na iri ise (ya bụ 650), na ngwongwo ọlaọcha dị otu narị talenti (ya bụ 100), na ọlaedo dị otu narị talenti (ya bụ 100).
EZR 8:27 Iri efere ọlaedo abụọ (20) nke ọnụahịa ya bụ puku darik (1,000), tinyere efere bronz abụọ e hichaziri nke ọma, nke dị oke ọnụahịa dị ka efere ọlaedo.
EZR 8:28 Emesịa, agwara m ha okwu sị ha, “Lee, unu onwe unu na ihe ndị a niile bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ọlaọcha na ọlaedo ndị a bụkwa onyinye afọ ofufu e nyere Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha.
EZR 8:29 Chenụ ha nche, debekwa ha nke ọma, tupu ruo mgbe unu ga-atụ ha nʼihu ndịisi nchụaja, na ndịisi Livayị, na ndịisi ụlọ nke Izrel nʼime Jerusalem, nʼime ụlọakụ nke ụlọ Onyenwe anyị.”
EZR 8:30 Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị kwenyere ibu ọlaọcha na ọlaedo, na ngwongwo ihe nsọ ndị ahụ, buga ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem.
EZR 8:31 Anyị hapụrụ osimiri Ahava nʼụbọchị nke iri na abụọ nke ọnwa mbụ, chee ihu anyị ịga Jerusalem. Chineke nọnyekwaara anyị, dọpụta anyị site nʼaka ndị iro ọbụla, na nʼaka ndị ohi.
EZR 8:32 Nʼikpeazụ, anyị rutere Jerusalem nʼudo, zukwaa ike ụbọchị atọ.
EZR 8:33 Nʼụbọchị nke anọ, site nʼoge anyị ruru, e jiri ihe ọtụtụ tụọkwa ọlaọcha na ọlaedo ahụ, ha na ngwongwo ihe nsọ ndị ọzọ ahụ. E mere nke a nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Ndị tụrụ ha bụ Meremot nwa Ụraya onye nchụaja, na Elieza nwa Finehaz. Jozabad nwa Jeshua, na Noadaya nwa Binui, ndị Livayị, sokwa tụọ ha.
EZR 8:34 Ihe niile zuru ezu dịka ịdị arọ ha si dị. E dekwara ọnụọgụgụ ihe a tụpụtara nʼakwụkwọ nʼoge ahụ.
EZR 8:35 Emesịa, onye ọbụla nʼime anyị si esi lọta chụụrụ Chineke Izrel aja nsure ọkụ. E ji oke ehi iri na abụọ chụọ aja maka ebo Izrel niile, ya na iri ebule itoolu na isii, na iri ụmụ ebule asaa na asaa. Ma e ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie. E jichakwa ha niile chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
EZR 8:36 E nyere ndịisi ọrụ eze niile, na ndịisi ọchịchị niile dị nʼofe ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis akwụkwọ iwu ahụ eze nyere. Ndịisi a nyekwara aka nʼọrụ iwughachi ụlọnsọ Chineke ahụ.
EZR 9:1 Mgbe e mesịrị ihe ndị a, ndịisi bịakwutere m sị, “Ndị Izrel na ndị nchụaja, na ndị Livayị, ekewapụghị onwe ha site nʼetiti ndị agbataobi ha, na omume arụ ha niile, dịka nke ndị Kenan, na ndị Het; na ndị Periz, na ndị Jebus, na ndị Amọn, na ndị Moab, na ndị Ijipt, na ndị Amọrait.
EZR 9:2 Ha alụtarala onwe ha nwunye site nʼụmụ ndị inyom mba ọzọ ndị a, lụtakwara ụmụ ha ndị ikom. Ha agwakọtala mkpụrụ nsọ na ndị dị iche iche nọ ha gburugburu. Ọ bụ ndị ndu na ndịisi ọchịchị ha bụ ndị butere ụzọ nʼibi ndụ ekwesighị ntụkwasị obi a.”
EZR 9:3 Ma mgbe m nụrụ nke a, adọwara m uwe ahụ m na uwe mwụda m, dọpụkwa ụfọdụ agịrị isi nke isi m, na ajị afụọnụ m, nọdụkwa ala nʼọnọdụ mgbagwoju anya.
EZR 9:4 Mgbe ahụ, ndị niile mara jijiji nʼokwu Chineke nke Izrel, gbakọtara m gburugburu nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọtaranụ. Mụ onwe m nọkwa nʼọnọdụ mgbagwoju anya ruo oge ịchụ aja nsure ọkụ nke anyasị.
EZR 9:5 Nʼikpeazụ, nʼoge aja uhuruchi, esitere m nʼiweda onwe m ala bilie, eji m uwe na uwe mwụda dọkara adọka daa nʼala nʼikpere m, chilie aka m abụọ elu, tikuo Onyenwe anyị Chineke m
EZR 9:6 nʼekpere sị, “Ihere na-eme m, Chineke m, amaghị otu m ga-esi lelie anya m lekwasị gị nʼihu, nʼihi na mmehie anyị babigara ụba oke, ikpe ọmụma dị na-eche anyị dịkwa ukwuu, nʼezie o ruola eluigwe.
EZR 9:7 Site nʼụbọchị nna nna anyị ha ruo taa, ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu. Nʼihi mmehie anyị, anyị na ndị eze anyị, na ndị nchụaja anyị ka enyefere nʼaka mma agha, na ndọta nʼagha, na ịpụnara anyị ihe nʼike na nweda nʼala nʼaka ndị eze ala mba ọzọ, dịka ọ dị taa.
EZR 9:8 “Ma ugbu a, na nwa oge nta a, gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị egosila anyị amara, mee ka ole na ole fọdụrụ anyị. O nyeela anyị ọnọdụ siri ike nʼime ebe nsọ ya. Chineke anyị na-enye anya anyị ìhè, mee ka anyị kurutu ume ndụ nʼoge a site nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị.
EZR 9:9 Nʼihi na ndị ohu ka anyị bụ, ma nʼihi obiọma na obi ebere gị, ị gbakụtaghị anyị azụ nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị. Kama i mere ka ndị eze Peshịa gosi anyị obi ebere. Ha enyekwala anyị ndụ ọhụrụ, nke anyị ga-eji nwee ike wughachi ụlọnsọ Chineke anyị, ma wuziekwa ebe ya niile dakpọrọ adakpọ. Ọzọkwa, o nyekwala anyị ebe ize ndụ site na mwugharị nke mgbidi Juda na Jerusalem.
EZR 9:10 “Ugbu a, Chineke anyị, gịnịkwa ka anyị nwere ikwu banyere ihe ndị a niile mere? Lee na anyị ahapụla gị ọzọ, hapụkwa ịgbaso iwu gị,
EZR 9:11 nke i ji dọọ anyị aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma, bụ ndị ohu gị. Nʼihi na i si nʼọnụ ha kwuo sị, ‘Ala ahụ unu na-abanye inweta bụ ala nke ndị bi nʼime ya mere ka ọ rụọ arụ. Nʼihi na ndị bi nʼime ya esitela nʼomume ọjọọ ha mee ka akụkụ ala ahụ niile rụọ arụ.
EZR 9:12 Ya mere, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụrụ, maọbụ kwenye ka ụmụ unu ndị ikom lụọ ụmụ ha ndị inyom. Unu achọkwala udo nke ọdịmma ọbụla nʼetiti unu na ha nʼoge ọbụla, ka unu dị ike, rie ezi ihe nke ala ahụ, hapụkwara ya ụmụ unu dịka ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’
EZR 9:13 “Ma ihe niile dakwasịrị anyị bụ maka ajọ omume anyị, nʼihi ikpe ọmụma dị ukwuu anyị. Ma lee, Chineke anyị ataghị anyị ahụhụ dịka ịdị ukwuu nke mmehie anyị si dị, kama, o mekwara ka ole na ole nʼime anyị fọdụ.
EZR 9:14 Ma anyị ọ ga-emebi iwu gị ọzọ, site nʼịlụ ndị a rụrụ arụ nʼomume ha? Ị gaghị eweso anyị iwe ruo na ị ga-ebibi anyị kpamkpam, na-afọdụghị otu onye?
EZR 9:15 Ma gị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel, ị bụ onye ezi omume. Lee anyị ka anyị guzo nʼihu gị nʼọnọdụ ikpe ọmụma anyị, ọ bụ ezie na o nweghị onye ọbụla nʼime anyị kwesiri iguzo nʼihu gị nʼihi nke a.”
EZR 10:1 Mgbe Ezra na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie ndị a, na-akwa akwa, na-atụ onwe ya nʼala nʼihu ụlọ Chineke, igwe ndị Izrel dị ukwuu, bụ ndị nwoke, na nwanyị, na ụmụntakịrị gbara ya gburugburu soro ya na-akwa akwa dị ilu.
EZR 10:2 Mgbe ahụ, Shekanaya nwa Jehiel, onye agbụrụ Elam, sịrị Ezra, “Anyị emehiela megide Chineke anyị, nʼihi nʼịlụ ndị inyom mba ọzọ ndị gbara anyị gburugburu. Ma otu ọ dị, olileanya ka dịrị ndị Izrel.
EZR 10:3 Ugbu a ka anyị gbaa ndụ nʼihu Chineke anyị, izilaga ndị inyom ndị mba ọzọ ndị a na ụmụ ha dịka ndụmọdụ onyenwe m Ezra, na ndị na-atụ egwu iwu Chineke anyị si dị. Ka e mee ihe ndị a dịka iwu si dị.
EZR 10:4 Biko, bilie gwa anyị ụzọ anyị ga-esi dozie ihe niile mebiri emebi. Anyị ga-eme ihe i kwuru.”
EZR 10:5 Mgbe ahụ, Ezra biliri jụọ ndịisi ndị nchụaja na ndị Livayị, na Izrel niile, ma ha ga-eme ihe Shekanaya kwuru. Ha niile ṅụrụ iyi kwenye na ha ga-eme ya.
EZR 10:6 Mgbe ahụ, Ezra si nʼihu ụlọ Chineke pụọ banye nʼime ọnụụlọ Jehohanan, nwa Eliashib. Mgbe ọ nọ nʼebe ahụ, o righị nri ọbụla, ọ ṅụghị mmiri ọbụla, nʼihi na ọ nọgidere na-eru ụjụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị si nʼebe a dọtara ha nʼagha lọta.
EZR 10:7 E zisara ozi na Juda na Jerusalem niile na a chọrọ ịhụ ndị niile si esi lọta na Jerusalem.
EZR 10:8 Ndịisi na ndị okenye kpebiri na onye ọbụla nke na-abịaghị nʼụbọchị atọ, dịka atụmatụ ha si dị, na a ga-anara onye ahụ akụ niile o nwere, kewapụkwa onye ahụ site na mkpọkọta ndị Izrel e mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ.
EZR 10:9 Mgbe ụbọchị atọ ahụ zuru, ndị ikom Juda na Benjamin niile zukọrọ na Jerusalem. Nʼụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa itoolu, mmadụ niile zukọrọ nọdụ nʼama dị nʼihu ụlọnsọ Chineke. Mmiri dị ukwuu zoro nʼụbọchị ahụ. Ụjọ tụkwara ndị ahụ niile zukọrọ nʼihi oke mmiri ozuzo ahụ na nʼihi okwu ahụ.
EZR 10:10 Mgbe ahụ Ezra onye nchụaja, biliri ọtọ, sị ha, “Unu emehiela, nʼihi na unu lụrụ ndị inyom mba ọzọ, si otu a tụkwasị ihe nʼikpe ọmụma dịrị Izrel.
EZR 10:11 Ugbu a, sọpụrụnụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna unu ha, meekwanụ ihe bụ nzube ya. Kewapụnụ onwe unu site nʼebe ndị mba ọzọ nọ, nakwa ebe nwunye ndị unu si mba ọzọ lụta.”
EZR 10:12 Nzukọ niile ahụ zara nʼotu olu sị. “Okwu gị ziri ezi, Anyị aghaghị ime dịka i kwuru.”
EZR 10:13 Ma ha zakwara sị, “Nke a abụghị ihe anyị ga-eme nʼotu ụbọchị maọbụ nʼụbọchị abụọ, nʼihi na aka ọtụtụ mmadụ nʼime anyị dị na mmehie ahụ. Mmiri na-ezosikwa ike, anyị enwekwaghị ike ịnọgide ruo oge dị anya.
EZR 10:14 Ka ndịisi anyị guzobe mkpọkọta niile. Ka ndị niile nọ nʼobodo anyị ndị lụrụ nwanyị site na mba ọzọ bịa nʼoge a kara aka, ha na ndị okenye na ndị ikpe nke obodo ọbụla, ruo mgbe oke iwe Chineke banyere okwu a sitere nʼebe anyị nọ pụọ.”
EZR 10:15 Ma ndị na-ekweghị ka e mee ya otu a bụ naanị Jonatan nwa Asahel na Jazeia nwa Tikva, na Meshulam na Shabetai onye Livayị.
EZR 10:16 Ya mere, ndị ahụ niile si esi lọta, mere dịka mkpebi ahụ si dị. Ezra họpụtara ụfọdụ ndị ikom, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ, e si nʼezinaụlọ ọbụla họpụta otu onye. E dekwara aha ndị niile a họpụtara nʼakwụkwọ. Ya mere, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa iri, ndị a malitere inyocha okwu ndị a.
EZR 10:17 Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ya bụ, nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ, ha rụchara ọrụ banyere ndị ikom lụrụ ndị inyom mba ọzọ.
EZR 10:18 A chọpụtara nʼetiti ụmụ ndị nchụaja, na ndị a lụrụ ndị inyom si na mba ọzọ. Ndị si nʼikwu Jeshua nwa Jozadak na ụmụnne ya bụ, Maaseia, Elieza, Jarib na Gedaliya.
EZR 10:19 Ha niile jikọrọ aka kpebiekwa na ha ga-ezila ndị nwunye ha. Onye ọbụla wetara ebule site nʼigwe atụrụ dịka ihe ikpe ọmụma.
EZR 10:20 Ndị si nʼikwu Imea bụ Hanani, na Zebadaya.
EZR 10:21 Ikwu Harim: Maaseia, Ịlaịja, Shemaya, Jehiel na Uzaya.
EZR 10:22 Ndị si nʼikwu Pashua: Elioenai, Maaseia, Ishmel, Netanel, Jozabad, na Eleasa.
EZR 10:23 Nʼime ndị Livayị: Jozabad, Shimei, Kelaya (onye a na-akpọkwa Kelita), Petahaya, Juda na Elieza.
EZR 10:24 Nʼime ndị na-abụ abụ, Eliashib. Nʼime ndị nche ọnụ ụzọ: Shalum, Telem, na Uri.
EZR 10:25 Nʼetiti ndị Izrel ndị ọzọ: Site nʼikwu Parosh: Ramaya, Izaya, Malkija, Mijamin, Elieza, Malkija na Benaya.
EZR 10:26 Site nʼikwu Elam: Matanaya, Zekaraya, Jehiel, Abdi, Jeremot na Ịlaịja.
EZR 10:27 Site nʼikwu Zatu: Elioenai, Eliashib, Matanaya, Jeremot, Zabad na Aziza.
EZR 10:28 Site nʼikwu Bebai: Jehohanan, Hananaya, Zabai, na Atlai.
EZR 10:29 Site nʼikwu Bani, Meshulam, Maluk, Adaya, Jashub, Sheal na Jeremot.
EZR 10:30 Site nʼikwu Pahat-Moab, Adna, Kelal, Benaya, Maaseia, Matanaya, Bezalel, Binui, na Manase.
EZR 10:31 Site nʼikwu Harim: Elieza, Ishija, Malkija, Shemaya, Shimeon,
EZR 10:32 Benjamin, Maluk na Shemaraya.
EZR 10:33 Site nʼikwu Hashum, Matenai, Matata, Zabad, Elifelet, Jeremai, Manase na Shimei.
EZR 10:34 Site nʼikwu Bani, Maadai, Amram, Uel,
EZR 10:35 Benaya, Bedeia, Keluhi
EZR 10:36 Venaya, Meremot, Eliashib
EZR 10:37 Matanaya, Matenai na Jaasu.
EZR 10:38 Site nʼikwu Bani: Binui na Shimei,
EZR 10:39 Shelemaya, Netan, Adaya,
EZR 10:40 Maknadebai, Shashai, Sharai,
EZR 10:41 Azarel, Shelemaya, Shemaraya,
EZR 10:42 Shalum, Amaraya na Josef.
EZR 10:43 Site nʼikwu Nebo: Jeiel, Matitaia, Zabad, Zebina, Jadai, Juel na Benaya.
EZR 10:44 Ndị a niile lụrụ ndị inyom site na mba ọzọ. Ha zilagara ha na ụmụ ha.
NEH 1:1 Nke a bụ okwu Nehemaya nwa Hakalaya: Nʼọnwa Kislev, nke afọ ahụ mere ya iri afọ abụọ nke ọchịchị Ataksekses mgbe m nọ nʼụlọeze dị na Susa,
NEH 1:2 otu nwanne m nwoke aha ya bụ Hanani, na ụfọdụ ndị ọzọ sitere Juda bịara ileta m. Ajụrụ m ha ajụjụ otu ihe si agara ndị Juu ahụ fọdụrụ, ndị si ebe dị iche iche lọta, jụọkwa ha maka Jerusalem.
NEH 1:3 Ha zara si: “Ndị ahụ niile lọtara nọ nʼoke nsogbu na ihere. A kụdara mgbidi Jerusalem; e sukwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ.”
NEH 1:4 Mgbe m nụrụ okwu ndị a, anọdụrụ m ala kwaa nnọọ akwa. Nʼezie, ajụrụ m iri ihe ọbụla ọtụtụ ụbọchị, nʼihi na eji m oge m niile kpee ekpere rịọ Chineke nke eluigwe arịrịọ,
NEH 1:5 si ya: “Gị, Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, onye dị ukwu na onye dịkwa egwu; gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya nke ndị ahụ hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile. Biko nụrụ arịrịọ m.
NEH 1:6 Leda anya ebere gị ka ị nụrụ arịrịọ mụ bụ ohu gị na-arịọ gị ehihie na nʼabalị. Ana m ekwupụta mmehie anyị bụ ụmụ Izrel, ma nke m na ezinaụlọ nna m mere megide gị.
NEH 1:7 Anyị emela ihe jọrọ njọ megide gị. Anyị edebeghị iwu gị na ụkpụrụ gị nke i nyere ohu gị Mosis.
NEH 1:8 “Chetakwa ntụziaka inyere Mosis bụ ohu gị, na-asị, ‘Ọ bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche.
NEH 1:9 Ma ọ bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na Jerusalem bụ obodo m họpụtara nye Aha m.’
NEH 1:10 “Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta.
NEH 1:11 Biko, Onyenwe anyị, nụrụ ekpere mụ bụ ohu gị, nụrụkwa ekpere ndị ohu gị niile ọ na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha gị. Mee ka ihe gara ohu gị nke ọma taa site nʼimere ya ebere nʼihu nwoke a.” Nʼoge ahụ abụ m onye na-ebu ihe ọṅụṅụ eze.
NEH 2:1 Nʼọnwa Nisan, nʼiri afọ abụọ nke ọchịchị eze Ataksekses, mgbe e wetaara eze mmanya. E buru m mmanya ahụ bugara ya eze. Ugbu a, o nwebeghị mgbe ọbụla m jirila ihu mgbarụ bịa nʼihu eze.
NEH 2:2 Ya mere, eze jụrụ m, “Gịnị mere ihu gị ji gbaruo mgbe ọ dịghị ọrịa ji gị? Nke a na-egosi naanị na obi jọrọ gị njọ.” Ụjọ tụrụ m nnọọ nke ukwu.
NEH 2:3 Azara m eze sị, “Onyenwe m, ka ọchịchị eze dị ogologo ndụ. Gịnị ga-eme ka obi dị m ụtọ ebe ọ bụ na obodo ahụ e liri nna nna m ha aghọọla mkpọmkpọ ebe, nke a kpọkwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ?”
NEH 2:4 Eze sịrị m, “Ọ bụ gịnị ka ị chọrọ?” Mgbe ahụ ekpere m ekpere nʼobi m nye Chineke,
NEH 2:5 ma zaa eze sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, biko, ọ bụrụkwa na ohu gị achọta ihuọma nʼanya gị, ana m arịọ ka ị ziga m Juda, bụ obodo nna nna m ha, ka m gaa wugharịakwa ya.”
NEH 2:6 Eze sịrị m, ebe nwunye ya nọkwa nʼakụkụ ya, “Ije gị ọ ga-abụ ruo olee mgbe, olee mgbe ị ga-alọghachitekwa?” Ọ masịrị eze i ziga m. Ya mere, enyere m ya oge.
NEH 2:7 Mgbe ahụ, asịrị m ya, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, aga m achọ ka i nye m akwụkwọ nke m ga-enye ndịisi ọchịchị niile nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, ka ha kwere ka m site nʼobodo ha gafee ruo mgbe m ga-eru na Juda.
NEH 2:8 Nyekwa m akwụkwọ ozi m ga-enye Asaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o nye m osisi nke a ga-eji rụzie ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ụlọnsọ, na nke a ga-eji rụọ mgbidi obodo ahụ, na nke m ga-eji rụọ ụlọ nke aka m.” Eze meere m ihe ndị a niile, nʼihi na aka ebere Chineke dịnyere m.
NEH 2:9 Mgbe m rutere obodo ndị a dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, enyere m ndịisi ọchịchị niile akwụkwọ ahụ eze dere nye m. Eze dunyere m ndịisi agha na ndị agha na-agba ịnyịnya ka ha chebe m nʼije m.
NEH 2:10 Ma mgbe Sanbalat, onye Horonaim, na Tobaya, onye Amọn bụ onyeisi ọrụ ọchịchị, nụrụ ihe banyere ọbịbịa m, iwe were ha nke ukwuu ịnụ na o nwere onye na-achọ inyere ndị Izrel aka.
NEH 2:11 E rutere m Jerusalem, nọdụkwa ebe ahụ mkpụrụ ụbọchị atọ,
NEH 2:12 eji m abalị pụọ kpọrọ mmadụ ole na ole. O nwebeghị onye ọbụla m gwara ihe Chineke tinyere m nʼobi ime na Jerusalem. Ọ dịghị ịnyịnya ọzọ anyị ji ma ọ bụghị nke ahụ m na-agba.
NEH 2:13 Nʼabalị a pụrụ m site nʼỌnụ ụzọ ama Ndagwurugwu ruo nʼisi iyi mmiri Nkịta ọhịa, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼỌnụ ụzọ ama ebe ikpofu ahịhịa. Anyị jegharịrị ịhụ ebe niile mgbidi Jerusalem dara ada, na ọnụ ụzọ ama ya niile nke ọkụ rere.
NEH 2:14 Emesịa, ejeruru m ọnụ ụzọ nke dị nʼebe isi iyi dị, ruokwa nʼọdọ mmiri eze, ma ịnyịnya ibu m enweghị ike isite nʼebe ahụ gafee.
NEH 2:15 Ya mere, ejiri m nʼabalị jeruo ndagwurugwu ahụ, leruo mgbidi ahụ anya. Emesịa, atụgharịrị m lọghachi site nʼọnụ ụzọ Ama ndagwurugwu.
NEH 2:16 Ndịisi obodo amaghị ebe m gara maọbụ ihe m na-eme, nʼihi na agwabeghị m onye Juu ọbụla ihe m bu nʼobi, maọbụ ndị nchụaja, maọbụ ndị a na-asọpụrụ, maọbụ ndị ọchịchị obodo, maọbụ onye ọzọ ọbụla ndị ga-arụ ọrụ ahụ.
NEH 2:17 Nʼikpeazụ, agwara m ha sị, “Unu maara nke ọma ihe dakwasịrị obodo anyị. Lee otu mgbidi ya si dakasịa, na otu ọnụ ụzọ ama ya si rechapụ ọkụ. Ka anyị wuzienụ mgbidi Jerusalem, si otu a wepụ ihe ihere a dịịrị anyị.”
NEH 2:18 Akọọrọ m ha ọchịchọ ahụ Chineke tinyere m nʼobi na ihe mụ na eze kwuru, na otu o si kwadoo ihe m gwara ya. Ha zara m sị, “Ọ dị mma, ka anyị wugharịanụ mgbidi ahụ.” Ọrụ ahụ bidokwara na-atụfughị oge.
NEH 2:19 Ma mgbe Sanbalat, onye Horon, na Tobaya, onyeozi ndị Amọn, na Geshem onye Arab, nụrụ ya, ha kwara anyị emo sị, “Gịnị bụ ihe nke a unu na-eme? Ọ bụ eze ka unu na-enupu isi megide?”
NEH 2:20 Ma azara m ha sị, “Chineke nke eluigwe ga-eme ka ihe gara anyị nke ọma. Anyị onwe anyị bụ ndị ohu ya ga-amalite iwughachi mgbidi a, ma unu onwe unu, unu enweghị oke maọbụ ọnọdụ ziri ezi maọbụ ihe ncheta ọbụla nʼime Jerusalem.”
NEH 3:1 Mgbe ahụ, Eliashib onyeisi nchụaja na ndị nchụaja ibe ya wuru mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu Narị na ụlọ elu Hananel. Ha wukwara Ọnụ Ụzọ ama Atụrụ, kwụba ibo ya, doo ya nsọ.
NEH 3:2 Ndị sitere obodo Jeriko rụkwara ọrụ nʼakụkụ ha. Ma Zakua nwa Imri, rụrụ ọrụ nke ha nʼakụkụ ndị ọrụ si Jeriko.
NEH 3:3 Ụmụ ndị ikom Hasena wuru Ọnụ Ụzọ ama Azụ, dobe osisi ya, kwụba ọnụ ụzọ ya, kpụọkwa ihe mkpọchi ya niile, na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.
NEH 3:4 Meremot, nwa Ụraya, nwa Hakoz, rụziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Onye na-eso ya bụ Meshulam, nwa Berekaya, nwa Meshezabel, rụziri mgbidi, onye na-esota ya bụ Zadọk nwa Baana, onye rụzikwara mgbidi.
NEH 3:5 Akụkụ nke ọzọ ka ndị ikom Tekoa rụziri, ma ndị ha a na-asọpụrụ ekweghị ehudata ubu ha nye ọrụ ahụ nʼokpuru ndị nlekọta ha.
NEH 3:6 Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia wuru Ọnụ Ụzọ Ama Jeshana. Ha tinyere osisi ya niile, kwụba ibo ọnụ ụzọ ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.
NEH 3:7 Ndị ọzọ rụrụ ọrụ nʼakụkụ ha bụ Melataya, onye Gibiọn, na Jadon onye Meronot, na ndị si Gibiọn na Mizpa. Obodo ndị a dị nʼokpuru onyeisi ọchịchị akụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis.
NEH 3:8 Uziel nwa Hahaya, bụ ọkpụ ụzụ ọlaedo, doziri otu akụkụ. Onye na-eso ya bụ Hananaya, otu onye nʼime ndị na-eme mmanụ otite na-esi isi ọma, doziri nke na-esote nke ahụ. Ha doziri Jerusalem ruruo ya na Mgbidi Obosara.
NEH 3:9 Onye na-eso ha bụ Refaya nwa Hua onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem.
NEH 3:10 Onye na-eso ya bụ Jedaya nwa Harumaf, onye rụrụ akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ nke aka ya. Onye na-eso ya nʼọrụ a bụ Hatush nwa Hashabneia.
NEH 3:11 Onye ọzọ bụ Malkija nwa Harim, na Hashub nwa Pahat-Moab, ndị wugharịrị ụlọ elu ọkụ, na otu akụkụ mgbidi ahụ.
NEH 3:12 Shalum nwa Halohesh na ụmụ ya ndị inyom meziri akụkụ mgbidi nke na-esota. Ọ bụ onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem nke ọzọ.
NEH 3:13 Hanun duuru ndị obodo Zanoa wuo Ọnụ Ụzọ Ndagwurugwu. Ha wuziri ya, tinye ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. Ha wuzikwara mpaghara ahụ nke ịdị ogologo ya ruru narị mita ise, ruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.
NEH 3:14 Malkija nwa Rekab, onyeisi ọchịchị ala nke dị Bet-Hakerem gburugburu, bụ onye wuziri ọnụ ụzọ ama dị nʼebe ikpofu ahịhịa. O tinyere ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.
NEH 3:15 Shalum nwa Kol-Hoze, onyeisi ọchịchị ala dị Mizpa gburugburu, wuziri ọnụ ụzọ ama isi iyi, kpuchie elu ya, tinye ya ibo ọnụ ụzọ ya, ihe mkpọchi na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. O mezikwara mgbidi ahụ site nʼọdọ mmiri Siloam ruo nʼubi eze a gbara ogige, na ruokwa na nkwasa nrịda dị site nʼobodo Devid ma e site Jerusalem na-apụta.
NEH 3:16 Onye na-eso ya bụ Nehemaya nwa Azbuk, onyeisi ọchịchị ọkara nʼime Bet Zoa. O wuziri mgbidi ahụ ruo ncherita ihu ebe ili Devid, ruokwa ọdọ ebe emere maka ichekọta mmiri, na nʼỤlọ ndị Dike nʼagha.
NEH 3:17 Ndị na-eso ya bụ ndị Livayị, ndị nke Rehum nwa Bani na-achịkọta. Onye ọzọ bụ Hashabaya onyeisi ọchịchị ọkara ndị bi na Keila. Ọ rụrụ ọrụ e kenyere ndị ya.
NEH 3:18 Onye ọzọ na-eso ya bụ Binui nwa Henadad onye bụ onyeisi ọchịchị ọkara akụkụ Keila nke ọzọ. O du ndị Keila ibe ya rụọ ọrụ ha ketara.
NEH 3:19 Onye na-eso ya bụ Eza nwa Jeshua onyeisi ọchịchị obodo Mizpa. Ya na ndị otu ya rụziri akụkụ mgbidi ahụ dị na mgbago ebe ụlọ nchịkọta ngwa agha ruo na nkuku ya.
NEH 3:20 Onye ọzọ na-eso ya bụ Baruk, nwa Zabai, onye ji nnọọ ịnụ ọkụ nʼobi rụzie mgbidi ahụ site na nkuku ya ruo nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ Eliashib, bụ onyeisi nchụaja.
NEH 3:21 Onye na-eso ya bụ Meremot nwa Ụraya, nwa Hakoz. Ọ sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ Eliashib rụziri ruo na ngwụcha ya.
NEH 3:22 Ndị nchụaja si nʼakụkụ Jerusalem wuziri akụkụ nke na-esote ya.
NEH 3:23 Isonye ha, Benjamin na Hashub wuziri akụkụ ahụ dị nʼihu ụlọ ha. Azaraya nwa Maaseia, onye bụkwa nwa nwa Ananaya wuziri nke na-esote ya, nke dịkwa nʼakụkụ ụlọ ya.
NEH 3:24 Binui nwa Henadad wuziri akụkụ nke ọzọ, nke sitere nʼihu ụlọ Azaraya ruo na nkuku mgbidi ahụ.
NEH 3:25 Palal nwa Uzai wuziri akụkụ nke na-eso ya site na nkuku mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu dị nʼakụkụ elu elu ụlọeze nʼebe dị nso nʼogige ndị nche. Nke so ya bụ Pedaia nwa Parosh,
NEH 3:26 na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ahụ bụ ndị bi nʼelu ugwu Ofel, wuziri akụkụ nke na-esote ruo nʼebe dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, ruokwa nʼụlọ elu nche nke ụlọ ukwu ahụ.
NEH 3:27 Ndị ikom Tekoa wuru akụkụ nke ọzọ na-esote ya. Ha sitere nʼebe chere ụlọ elu nche nke ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, wuzie mgbidi ahụ ruo na mgbidi dị Ofel nso.
NEH 3:28 Ụfọdụ ndị nchụaja wuziri akụkụ na-esote, nke dị nʼugwu, site nʼỌnụ Ụzọ Ama Ịnyịnya. Onye ọbụla wuziri mgbidi nke dị nʼihu ụlọ ya.
NEH 3:29 Zadọk nwa Imea wuziri nke na-esota, bu akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ ya. Shemaya nwa Shekanaya onye na-eche Ọnụ Ụzọ Ama Ọwụwa Anyanwụ wuziri akụkụ nke na-esota.
NEH 3:30 Hananaya nwa Shelemaya na Hanun nwa Zalaf nke isii, wuziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Meshulam nwa Berekaya wuziri akụkụ mgbidi na-esota, bụkwa nke dị nʼihu ụlọ obibi ya.
NEH 3:31 Malkija ọkpụ ụzụ ọlaedo wuziri akụkụ na-esota ruo nʼụlọ ahụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ndị na-azụ ahịa na-anọkọ. Ụlọ a dị na ncherita ihu Ọnụ Ụzọ Ama Nnyocha. Malkija sitekwara nʼebe ahụ wuzie mgbidi ahụ ruo nʼọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ.
NEH 3:32 Ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo na ndị ahịa rụchara ọrụ iwuzi akụkụ mgbidi nke fọdụrụ, site nʼetiti ọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ.
NEH 4:1 Iwe were Sanbalat nke ukwuu mgbe ọ nụrụ na anyị na-ewuzigharị mgbidi ahụ niile. O were iwe dị ọkụ, ọnụma jukwara ya obi. Ọ chịrị ndị Juu ọchị, kwaakwa ha emo.
NEH 4:2 Nʼihu ndị otu ya na ndịisi agha Sameria, o kwuru si, “Gịnị ka ndị Juu ole na ole a na-adịghị ike na-eme? Ha na-achọ iwugharị mgbidi obodo a? Ha ga-achụ aja? Ha ga-arụcha ọrụ niile nʼotu ụbọchị? Ha ga-esita nʼaja a kụpịasịrị akụpịa mee ka nkume ndị a dị ndụ, ka ọ bụ site na nkume ochie ndị a akpọrọ ọkụ?”
NEH 4:3 Tobaya onye Amọn, onye nọ ya nʼakụkụ mgbe ahụ, kwukwara okwu sị; “Leenụ ụdị mgbidi ha na-ewu! Ọ bụrụ na nkịta ọhịa arịkwasị ya nʼelu ọ ga-ada!”
NEH 4:4 Mgbe ahụ, e kpere m ekpere sị, “Chineke, biko nụrụ emo a na-akwa anyị. Ka ịkwa emo ha laghachikwa ha nʼisi; ka a dọtakwa ha nʼagha buru ha jee mba ọzọ.
NEH 4:5 Elefula mmehie ha anya, agbagharakwala ha, nʼihi na ha ledara gị anya, ledakwa anyị anya, bụ ndị na-ewuzi mgbidi gị.”
NEH 4:6 Ya mere, anyị wuziri mgbidi ahụ ruo mgbe ha niile ruru ọkara nʼịdị elu ya, nʼihi na onye ọbụla wepụtara obi ya ịrụ ọrụ.
NEH 4:7 Ma mgbe Sanbalat, Tobaya, ndị Arab, ndị Amọn na ndị Ashdọd nụrụ na ọrụ iwuzi mgbidi Jerusalem na-aga nʼihu, nụkwa na-emechichala ebe niile puru epu, iwe were ha nke ukwuu.
NEH 4:8 Ha niile gbara izu ịchịrị ndị agha bịa imegide Jerusalem, ime ka ọgbaaghara dị nʼobodo ahụ.
NEH 4:9 Ma anyị kpere ekpere nye Chineke, kwụbakwa ndị nche iguzogide ha ehihie na abalị.
NEH 4:10 Mgbe ahụ, ndị Juda bidoro itamu ntamu na-asị, na ike ebidola ịgwụ ndị ọrụ ha, na mkpọmkpọ ihe fọdụrụ ka buru ibu, na naanị anyị apụghị ịrụcha mgbidi ahụ.
NEH 4:11 Ma nʼotu oge ahụ kwa, ndị iro anyị na-agba izu nʼakụkụ, na-achọ igbu anyị mgbe anyị na-eleghị anya ha maọbụ mara ka ọrụ ahụ kwụsị.
NEH 4:12 Ndị Juu ndị bi ha nso bịara ọtụtụ mgbe gwa anyị, “Ebe ọbụla unu gbagara, ha ga-ebuso unu agha.”
NEH 4:13 Nʼihi ya, eguzobere m ndị ụfọdụ nʼebe niile dịkarịsịrị ala nʼazụ mgbidi ahụ, nʼebe niile ghere oghe, e guzobere ha, kpanye ha mma agha, ùbe na ụta nʼaka dịka ezinaụlọ ha si dị.
NEH 4:14 Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, “Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ezinaụlọ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha.”
NEH 4:15 Mgbe ndị iro anyị chọpụtara na anyị amatala izu ọjọọ ha, na Chineke emebiekwala atụmatụ ha, anyị onwe anyị laghachiri nʼọrụ anyị nke iwuzi mgbidi ahụ.
NEH 4:16 Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, anyị kere onwe anyị ụzọ abụọ. Ụfọdụ ndị ji ùbe, ọta na ụta na-anọ na nche mgbe ndị ọzọ na-arụ ọrụ. Ndịisi niile pụtakwara guzo nʼazụ ndị Juda niile ebe ha nọ nʼihu ọrụ ha.
NEH 4:17 Ndị na-edo nkume na ndị ọrụ ọbụla debere ngwa ọgụ ha nʼebe ọ ga-eru ha aka mgbe ọbụla ha na-arụ ọrụ.
NEH 4:18 Ndị ọzọ tinyere mma agha ha nʼukwu ha. Ndị na-egbu opi nọkwa m nʼakụkụ mgbe niile maka ịfụ opi mgbe a chọrọ ya.
NEH 4:19 Mgbe ahụ, asịrị m ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị na ndị mmadụ ọzọ ahụ niile, “Ọrụ anyị nwere ịrụ dị ukwuu, gbasapụkwa, anyị anọkọtaghị ọnụ nʼotu ebe, ekewakwara anyị ebe dị iche iche na mgbidi.
NEH 4:20 Ya mere, mgbe ọbụla unu nụrụ ụda opi, gbaranụ ọsọ bịa nʼebe m nọ. Chineke ga-alụkwara anyị ọgụ.”
NEH 4:21 Ya mere, anyị nọgidere nʼọrụ anyị site nʼìhè mbụ nke ụtụtụ rụọ mgbe kpakpando pụtara. Ọkara nʼime ndị ọrụ jikwa ùbe nọrọ na nche.
NEH 4:22 Agwara m ndịisi ọrụ niile okwu sị ha na onyeisi ọrụ ọbụla na ndị na-enyere ya aka nʼọrụ ga na-anọ na Jerusalem nʼabalị niile. Nʼụzọ dị otu a, ndị ọrụ ga-arụ ọrụ ha nʼoge ihe dị, ma ha ga-anọkwa na nche nʼabalị.
NEH 4:23 Nʼoge ndị a niile, eyipụghị m uwe m yi nʼahụ. O nwekwaghị onye ọbụla ọzọ, maọbụ nwanne m nwoke, maọbụ ndị nche na-eso m onye yipụrụ uwe ya ma onye ukwu ma onye nta. Mma agha anyị na-adịkwa anyị nʼukwu mgbe niile, ọbụladị mgbe anyị chọrọ mmiri.
NEH 5:1 Nʼoge ahụ, ụfọdụ ezinaụlọ bidoro itamu ntamu megide ndị Juu ibe ha.
NEH 5:2 Ụfọdụ na-atamu na-asị, “Anyị na ụmụ anyị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ bụrụ na anyị ga-eri nri dị ndụ, o kwesikwara ka anyị nwee ike ịzụrụ ọka.”
NEH 5:3 Ndị ọzọ na-asịkwa, “Anyị agbaala ubi anyị, ubi vaịnị anyị na ụlọ anyị nʼibe ka anyị nweta mkpụrụ ubi nʼoge ụnwụ.”
NEH 5:4 Ma ndị ọzọkwa na-asị, “Lee na anyị gbazitere ego anyị ji tụọ ụtụ isi eze maka ubi anyị na ubi vaịnị anyị.
NEH 5:5 Nʼagbanyeghị na ọ bụ otu anụ ahụ na ọbara ka anyị na ndị Juu ọzọ nwere, dịka ụmụ ha dị ka ụmụ anyị dịkwa, ma anyị emeela ka ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom bụrụ ndị ohu. Ụfọdụ nʼime ụmụ anyị ndị inyom abụrụlarị ndị ohu, ma anyị enweghị ike nke aka anyị, nʼihi na ndị ọzọ bụ ndị nwezi ala ubi anyị na ubi vaịnị anyị niile.”
NEH 5:6 Iwe were m nke ukwuu mgbe m nụrụ mkpu akwa ha na mkpesa ndị a.
NEH 5:7 Ya mere, mgbe m chesiri echiche banyere ya, e boro m ndị a na-asọpụrụ na ndị ọchịchị ebubo. A gwara m ha, “Unu na-anara ụmụnna unu ọmụrụnwa ego unu enyere ha.” Ya mere, a kpọrọ m nzukọ ọha mmadụ maka imegide ha.
NEH 5:8 Nʼụbọchị nzukọ ahụ, agwara m ha okwu sị, “Ọtụtụ nʼime anyị na-agbalị nʼụzọ niile ịhụ na anyị zụtaghachiri ụmụnna anyị ndị Juu bu ndị e resiri ndị mba ọzọ. Ma unu nọ nʼebe a na-agbalị ime ha ka ha ghọọ ndị ohu unu. Ruo ole mgbe ka anyị ga-anọgide na-agbapụta ha site nʼọnọdụ ibu ohu?” Ma ha niile ekwughị okwu ọbụla, nʼihi na ha enweghị ihe ha ga-ekwu.
NEH 5:9 Agwakwara m ha okwu ọzọ sị, “Ihe unu na-eme jọrọ njọ. O kwesighị ka unu tụọ egwu Chineke si otu a gbanarị nkọcha nke ndị iro anyị, bụ ndị mba ọzọ?”
NEH 5:10 Mụ onwe m na ụmụnna m na ndị na-ejere m ozi na-agbazinye ụmụnne anyị ego na ọka. Ma ka anyị kwụsị ịnara ọmụrụnwa.
NEH 5:11 Nyeghachinụ ha ala ubi ha niile ngwangwa, ma ubi vaịnị ha niile, ubi oliv ha niile, ụlọ ha niile na ọmụrụnwa nke unu na-anara ha nke bụ otu ụzọ nʼime narị nke ego, ọka, mmanya ọhụrụ na mmanụ.
NEH 5:12 Ha sịrị, “Anyị ga-enyeghachi ha. Anyị agakwaghị anara ha ihe ọzọ. Anyị ga-emezu ihe i kwuru.” Mgbe ahụ, akpọkọtara m ndị nchụaja, mee ka ndị ndu na ndịisi ozi ṅụọ iyi imezu nkwa ha.
NEH 5:13 Ayọgharịrị m ọnụ ọnụ uwe mwụda m sị, “Otu a ka Chineke ga-esi yọchapụ site nʼụlọ ha na ihe nweta ha onye ọbụla nke na-agaghị edebezu nkwa a.” Ndị niile zukọrọ kwere sị, “Amen.” Ha tokwara Onyenwe anyị: Ha niile mekwara ihe ha kwere na nkwa.
NEH 5:14 Ọzọ, nʼime afọ iri na abụọ ahụ a họpụtara m ị bụ onyeisi ọchịchị na Juda, site nʼiri afọ abụọ nke ịbụ eze Ataksekses ruo nʼafọ iri atọ na abụọ ya, mụ na ụmụnne m esiteghị na nri a na-atụkọrọ onyeisi ọchịchị were ihe oriri ọbụla.
NEH 5:15 Ma ọ bụghị otu a ka o si dị na mbụ, nʼihi na ndịisi ọchịchị niile buru m ụzọ chịa boro ndị ahụ ibu arọ dị ukwuu. Ha na-anakọta site nʼaka onye ọbụla iri mkpụrụ ọlaọcha anọ, tinyere ihe oriri na mmanya ha na-ewebatakwa. Ọbụladị ndị na-enyere ha aka mekpakwara ndị mmadụ ahụ. Ma emeghị m otu a, nʼihi ịtụ egwu Chineke.
NEH 5:16 Kama, anọgidesiri m ike nʼọrụ iwugharị mgbidi ahụ, achịkọtara ndị ikom m niile nʼebe ahụ nʼihi ije ozi a. Ọ dịghịkwa ala anyị zụrụ.
NEH 5:17 Ma otu ọ dị, ndịisi Juu ọnụọgụgụ ha dị otu narị na iri na ise na-eri nri na tebul m, tinyere ndị na-abịakwute anyị site na mba ndị dị anyị gburugburu.
NEH 5:18 Ihe na-ezu nri a na-eri nʼụlọ m kwa ụbọchị bụ otu ehi na atụrụ isii gbara abụba, na ọtụtụ ọkụkụ, na ụdị mmanya dị iche iche a na-ebubata kwa ụbọchị iri ọbụla. Nʼagbanyeghị nke a, ọ dịghị mgbe ọbụla m nara site nʼaka ha ụtụ ihe oriri nke onye na-achị ala kwesiri inweta, nʼihi na ha onwe ha nọ na mkpa dị ukwuu.
NEH 5:19 Chineke m biko, echefula ihe m meere ndị a, gọzie m nʼụzọ nke gị.
NEH 6:1 Mgbe a gwara Sanbalat, na Tobaya, na Geshem onye Arab, na ndị iro anyị ndị ọzọ na m ewuzichaala mgbidi ahụ, na ọ dịkwaghị ntipu fọdụrụ na ya, ọ bụ ezie na nʼoge ahụ, etinyebeghị m ibo nʼọnụ ụzọ ama ya niile,
NEH 6:2 Sanbalat na Geshem zitere m ozi a, “Bịa ka anyị zụkọta nʼotu obodo nta nke dị nʼobosara ala Ono.” Ma ha na-achọ ụzọ imerụ m ahụ.
NEH 6:3 Ya mere, azara m ha site nʼaka ndị ozi sị, “Ana m arụ ọrụ dị oke mkpa, agaghị enwe ike ịrịdata. Nʼihi gịnị ka ọrụ a ga-eji kwụsị mgbe m ga-ahapụ ya ịbịa nʼebe ị nọ?”
NEH 6:4 Ha zitere ozi ahụ ugboro anọ, ma enyere m ha otu ọsịsa ahụ ugboro anọ.
NEH 6:5 Na nke ugboro ise, Sanbalat ziteere m onye na-ejere ya ozi, ya na akwụkwọ ozi nke e mechighị emechi o ji bịa.
NEH 6:6 Nke a bụ ihe e dere nʼime ya; “Anụla ya na mba niile, Geshem kwukwara otu ihe ahụ, na gị na ndị Juu na-akwado inupu isi. Ọ bụ ya mere i ji na-ewu mgbidi ahụ. Ozi ahụ na-ekwukwa na gị onwe gị na-achọ ịbụ eze ha,
NEH 6:7 na ị họpụtala ndị amụma ndị ga-ekwupụta na Jerusalem na ị bụ eze ndị Juda. Ugbu a, ozi a ga-eru ntị eze, ya mere, bịa ka mụ na gị kparịtaa ụka nʼetiti onwe anyị.”
NEH 6:8 Ma eziri m ya ozi sị, “O nweghị eziokwu ọbụla dị nʼihe ị na-ekwu, nʼihi na ha bụ ihe i chepụtara nʼobi gị.”
NEH 6:9 Nzube ha bụ ime ka ụjọ tụọ anyị. Ha na-echekwa sị, “Ha ga-ada mba nʼọrụ a ma hapụkwa ịrụcha ya.” Ma akpọkuru m Chineke sị ya, “Biko gbaa aka m ume.”
NEH 6:10 Otu ụbọchị, a gara m nʼụlọ Shemaya, nwa Delaya, nwa Mehetabel, onye e mechibidoro ụzọ nʼụlọ ya. Ọ sịrị m, “Ka anyị zukọta nʼụlọ Chineke, nʼime ụlọnsọ, ka anyị mechiekwa ụzọ niile nke ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ndị ikom na-abịa igbu gị, e, nʼabalị ka ha na-abịa igbu gị.”
NEH 6:11 Ma azara m si; “O kwesiri ka mụ onwe m bụ onyeisi ọchịchị gbaa ọsọ? O kwesiri ka mmadụ dịka m gbaa ọsọ gbaba nʼụlọnsọ Chineke ịzọpụta ndụ ya? Agaghị m aga.”
NEH 6:12 Mgbe ahụ ka o doro m anya na Chineke agwaghị ya okwu ọbụla, kama na ọ bụ Tobaya na Sanbalat zụrụ ya.
NEH 6:13 E goro ya ọrụ ka o yinye m egwu, ka m site na-ime otu a mehie, mgbe ahụ, ha ga-ahụ ihe ha ga-eji nye m aha ọjọọ, kwaa m emo.
NEH 6:14 “Chineke m, cheta Tobaya na Sanbalat, nʼihi ihe ndị a niile ha mere, chetakwa Noadaya, bụ onye amụma nwanyị, na ndị amụma ndị ọzọ niile fọdụrụ, bụ ndị ahụ chọrọ ime ka m tụọ egwu.”
NEH 6:15 E wuchara mgbidi ahụ nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Elul, nʼime iri ụbọchị ise na abụọ.
NEH 6:16 Mgbe ndị iro anyị niile nụrụ ya, mba niile ndị nọ anyị gburugburu tụrụ ụjọ, obi jụkwara ha oyi, nʼihi na ha matara na-arụrụ ọrụ a site nʼinyeaka Chineke.
NEH 6:17 Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ ndị Juda a na-asọpụrụ na e zigara Tobaya ọtụtụ akwụkwọ ozi, akwụkwọ ozi Tobaya na-erutekwa ha aka.
NEH 6:18 Nʼihi na ọtụtụ ndị Juda ṅụrụ iyi ịnọ ya nʼukwu, nʼihi na ọgọ ya nwoke nʼala Juda bụ Shekanaya nwa Ara. Ọzọkwa, Jehohanan nwa nwoke Tobaya na-alụ nwa nwanyị Meshulam, nwa Berekaya.
NEH 6:19 Ha niile nọgidere na-agwa m otu Tobaya si bụrụ ezigbo mmadụ. Ma ha na-apụkwa gaa kọọrọ ya ihe niile m kwuru. Nʼihi ya Tobaya zitere ọtụtụ akwụkwọ ozi ime ka ụjọ tụọ m.
NEH 7:1 Mgbe e wuzichara mgbidi ahụ, na mgbe m guzobesịrị ibo nʼọnụ ụzọ ya niile nʼọnọdụ ha, họpụtakwa ndị ọbụ abụ na ndị nche, na ndị Livayị.
NEH 7:2 Enyefere m ọrụ ilekọta Jerusalem nʼaka nwanne m nwoke bụ Hanani, ya na Hananaya onye bụ onyeisi ụlọ ukwu ahụ e wusiri ike, nʼihi na ọ bụ nwoke na-ekwu eziokwu, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ.
NEH 7:3 Agwara m ha, “Na-emeghenụ ọnụ ụzọ ama naanị mgbe chi bọziri nke ọma. Kpọchiekwa ha mgbe ndị nche ka nọ na nche. Họpụtakwanụ ndị bi na Jerusalem ka ha bụrụ ndị nche. Ụfọdụ ga-eche nʼebe a họpụtara ha, ụfọdụ ga-eche nʼakụkụ ụlọ nke aka ha.”
NEH 7:4 Nʼoge a obodo ahụ buru ibu dịkwa mbara, ma ndị bi nʼime ya dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, ụlọ ndị dị nʼime ya bụkwa ihe ewugharịbeghị.
NEH 7:5 Ya mere Chineke m tinyere ya nʼobi m ka m chịkọta ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị, na ndị niile bi nʼobodo, maka idebanye aha nʼakwụkwọ ezinaụlọ nʼezinaụlọ. Achọtara m ebe e depụtara usoro ndị mmadụ niile bụ ụzọ lọta Juda nʼoge gara aga. Nke a bụ ihe m chọpụtara edere nʼime ya:
NEH 7:6 Ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa nʼala ọzọ. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke aka ya.
NEH 7:7 Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Azaraya, Raamaya, Nahamani, Mọdekai, Bilshan, Misperet, Bigvai, Nehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:
NEH 7:8 Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172),
NEH 7:9 nke Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ (372),
NEH 7:10 nke Ara, narị isii na iri ise na abụọ (652),
NEH 7:11 nke Pahat-Moab site nʼụmụ Jeshua na Joab, puku abụọ, na narị asatọ na iri na asatọ (2,818),
NEH 7:12 nke Elam, otu puku, na narị abụọ na iri ise na anọ (1,254),
NEH 7:13 nke Zatu, narị asatọ na iri anọ na ise (845),
NEH 7:14 nke Zakai, narị asaa na iri isii (760),
NEH 7:15 nke Binui, narị isii na iri anọ na asatọ (648),
NEH 7:16 nke Bebai, narị isii na iri abụọ na asatọ (628),
NEH 7:17 nke Azgad, puku abụọ, na narị atọ na iri abụọ na abụọ (2,322),
NEH 7:18 nke Adonikam, narị isii na iri isii na asaa (667),
NEH 7:19 nke Bigvai, puku abụọ, na iri isii na asaa (2,067),
NEH 7:20 nke Adin, narị isii na iri ise na ise (655),
NEH 7:21 nke Atea (site na Hezekaya), iri itoolu na asatọ (98),
NEH 7:22 nke Hashum, narị atọ na iri atọ na asatọ (328),
NEH 7:23 nke Bezai, narị atọ na iri abụọ na anọ (324),
NEH 7:24 nke Harif, otu narị na iri na abụọ (112),
NEH 7:25 nke Gibiọn, iri itoolu na ise (95).
NEH 7:26 Ndị ikom Betlehem na Netofa, otu narị na iri asatọ na asatọ (188),
NEH 7:27 ndị Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ (128),
NEH 7:28 ndị Bet-Azmavet, iri anọ na abụọ (42),
NEH 7:29 ndị Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ (743),
NEH 7:30 ndị Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu (621),
NEH 7:31 ndị Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ (122),
NEH 7:32 ndị Betel na Ai, otu narị na iri abụọ na atọ (123),
NEH 7:33 ndị Nebo nke ọzọ, iri ise na abụọ (52),
NEH 7:34 ndị agbụrụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254),
NEH 7:35 ndị Harim, narị atọ na iri abụọ (320),
NEH 7:36 ndị Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise (345),
NEH 7:37 ndị Lod, Hadid, na Ono, narị asaa na iri abụọ na otu (721),
NEH 7:38 ndị Senaa, puku atọ, na narị itoolu na iri atọ (3,930).
NEH 7:39 Ndị nchụaja: ndị agbụrụ Jedaya site nʼezinaụlọ Jeshua, narị itoolu na iri asaa na atọ (973),
NEH 7:40 ndị Imea, otu puku, na iri ise na abụọ (1,052),
NEH 7:41 ndị Pashua, otu puku, na narị abụọ na iri anọ na asaa (1,247),
NEH 7:42 ndị Harim, otu puku, na iri na asaa (1,017).
NEH 7:43 Ndị Livayị: ndị agbụrụ Jeshua site na Kadmiel nke ụmụ Hodavaya, iri asaa na anọ (74).
NEH 7:44 Ndị ọbụ abụ: ndị agbụrụ Asaf, otu narị, na iri anọ na asatọ (148).
NEH 7:45 Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu: ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai otu narị, na iri atọ na asatọ (138).
NEH 7:46 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ: ndị agbụrụ Ziha, Hasufa na ndị Tabaot,
NEH 7:47 Keros, Sia, Padon,
NEH 7:48 Lebana, Hagaba, Shalmai,
NEH 7:49 Hanan, Gidel, Gaha,
NEH 7:50 Reaya, Rezin, Nekoda,
NEH 7:51 Gazam, Ụza, Pasea,
NEH 7:52 Besai, Meunim, Nefusim,
NEH 7:53 Bakbuk, Hakufa, Hahua,
NEH 7:54 Bazlut, Mehida, Hasha,
NEH 7:55 Bakos, Sisera, Tema,
NEH 7:56 Nezaya na Hatifa.
NEH 7:57 Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Soferat, Perida,
NEH 7:58 Jaala, Dakon, Gidel,
NEH 7:59 Shefataya, Hatil, Pokeret-Hazebaim na Amọn.
NEH 7:60 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ (392).
NEH 7:61 Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.
NEH 7:62 Ndị agbụrụ: Delaya, ndị Tobaya na ndị Nekoda, narị isii na iri anọ na abụọ (642).
NEH 7:63 Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ: Hobaya, Hakoz na Bazilai (nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead a kpọọ ya aha nʼaha ha).
NEH 7:64 Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.
NEH 7:65 Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.
NEH 7:66 Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii (42,360),
NEH 7:67 nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa, na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ, na iri anọ na ise (245).
NEH 7:68 Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ịnyịnya muul narị abụọ na iri anọ na ise (245),
NEH 7:69 ịnyịnya kamel dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa na iri abụọ (6,720).
NEH 7:70 Ma ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye maka ọrụ ahụ. Onyeisi ọchịchị tinyere nʼụlọakụ otu puku darik ọlaedo (1,000), iri efere ọlaedo ise (50) na uwe ndị nchụaja narị ise na iri atọ (530).
NEH 7:71 Ụfọdụ ndịisi ezinaụlọ tinyere nʼụlọakụ maka ije ozi ahụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na ọtụtụ minas ọlaọcha puku abụọ na narị abụọ (2,200).
NEH 7:72 Nkpọkọta ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ fọdụrụ nyere bụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na minas ọlaọcha puku abụọ (2,000), na uwe ndị nchụaja iri isii na asaa (67).
NEH 7:73 Ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị nche ọnụ ụzọ, ndị ọbụ abụ na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ na ndị Izrel niile fọdụrụ, gara birikwa nʼobodo nke ha. Mgbe ọnwa asaa ruru, nʼoge a ndị Izrel niile e birila nʼobodo nke aka ha,
NEH 8:1 Ndị mmadụ niile zukọrọ dịka otu onye na mbara ala dị nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri. Ha gwara Ezra onye nkuzi ka ọ weta akwụkwọ Mosis, nke Onyenwe anyị nyere ndị Izrel nʼiwu.
NEH 8:2 Ya mere, Ezra, onye nchụaja wepụtara akwụkwọ Iwu ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa asaa nʼihu mkpọkọta ahụ bụ nke ndị ikom na ndị inyom na onye ọbụla ga-aghọta ihe mejupụtara.
NEH 8:3 O chere ihu nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri were oke olu gụọ ya site nʼụtụtụ ruokwa ehihie nʼihu ndị nwoke, ndị nwanyị na ndị ọzọ nwere ike ịghọta ihe o na-agụ. Mmadụ niile gekwara ntị na ngụpụta nke akwụkwọ iwu ahụ.
NEH 8:4 Ezra onye ode akwụkwọ, rigoro nʼelu ihe mgbakwasị ụkwụ ha mere maka nke a. Ndị guzo nʼaka nri ya bụ, Matitaia, Shema, Anaia, Ụraya, Hilkaya na Maaseia. Ndị guzo nʼaka ekpe ya bụkwa ndị a: Pedaia, Mishael, Malkija, Hashum, Hashbadana, Zekaraya na Meshulam.
NEH 8:5 Ezra meghere akwụkwọ ahụ mgbe mmadụ niile na-ahụzu ya nʼihi na o guzoro nʼebe dị elu mgbe ọ na-agụ ya. Mmadụ niile guzoro ọtọ mgbe ọ na-agụ ya.
NEH 8:6 Mgbe ahụ, Ezra gọziri Onyenwe anyị Chineke ukwu ahụ, mmadụ niile zakwara sị; “Amen! Amen!” Ha chịlịri aka ha abụọ elu, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị.
NEH 8:7 Ndị Livayị aha ha bụ Jeshua, Bani, Sherebaya, Jamin, Akub, Shabetai, Hodia, Maaseia, Kelita, Azaraya, Jozabad, Hanan na Pelia, kuziri ndị mmadụ ihe dị nʼIwu mee ka ha ghọta ya dịka ha guzo nʼebe ahụ.
NEH 8:8 Ha gụpụtara site nʼakwụkwọ iwu Chineke ahụ, sụgharịa ya, kọwazie ọkpụrụkpụ okwu niile dị nʼihe a gụpụtara, mee ka ndị mmadụ ghọta ihe a na-agụpụta nke ọma.
NEH 8:9 Mgbe ahụ, Nehemaya, onyeisi ọchịchị, na Ezra, ode akwụkwọ na onye nchụaja, na ndị Livayị ahụ na-atụziri ndị mmadụ ihe, gwara ndị ahụ niile sị: “Taa bụ ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị, Chineke unu. Unu erula ụjụ maọbụ bee akwa.” Nʼihi na ha niile na-akwa akwa mgbe ha na-ege ntị nʼokwu niile nke iwu ahụ.
NEH 8:10 Nehemaya gwakwara ha sị; “Laanụ nʼụlọ unu gaa mee mmemme oriri na ọṅụṅụ nyekwanụ ndị na-enweghị nke ha ga-eri. Ụbọchị taa dị nsọ nye Chineke anyị. Unu erukwala ụjụ, nʼihi na ọṅụ Onyenwe anyị bụ ike unu.”
NEH 8:11 Ndị Livayị mere ka ndị mmadụ ahụ nọrọ nwayọọ, na-asị, “Nọrọnụ nwayọọ, nʼihi na taa bụ ụbọchị dị nsọ, ọ bụghị ụbọchị iru ụjụ na anya mmiri.”
NEH 8:12 Ya mere, ha niile lawara ị ga rie ma ṅụọ, na ikenye ndị ọzọ site nʼihe ha nwere. Ha gakwara ime mmemme nke oke ọṅụ, nʼihi na ha ghọtara okwu agwara ha.
NEH 8:13 Nʼụbọchị nke abụọ nke ọnwa ahụ, ndịisi ezinaụlọ niile na ndị nchụaja, na ndị Livayị, zukọrọ nʼebe Ezra, bụ onye nkuzi nọ, maka itinye uche nʼakwụkwọ iwu ahụ.
NEH 8:14 Mgbe ha na-agụ ya, ha chọpụtara ebe Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya na ụmụ Izrel kwesiri ibi nʼụlọ ikwu mgbe ọbụla a na-eme mmemme ụlọ ikwu nke a ga-eme nʼọnwa ahụ.
NEH 8:15 O kwukwara na ha ga-ekwusa okwu a nʼobodo niile nke Juda na Jerusalem sị; “Gaanụ nʼala ugwu ugwu gbute alaka osisi oliv ụlọ, na alaka oliv ọhịa, na alaka osisi mietul, na alaka nkwụ, na alaka osisi ndị ọzọ na-enye ndo nke a ga-eji wuo ebe unu ga-ebi tutu ruo mgbe mmemme ahụ ga-agwụsị, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu.”
NEH 8:16 Ya mere, ndị ahụ pụrụ gaa weta alaka osisi, jiri ha wuore onwe ha ụlọ ahịhịa ha ga-ebi nwa mgbe nta nʼelu ụlọ ha, na nʼogige ụlọ nke aka ha, nakwa nʼogige ụlọ Chineke, na mbara ala Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, na nʼakụkụ Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem.
NEH 8:17 Ndị ahụ niile si na ndọta nʼagha lọta wuuru onwe ha ụlọ ikwu biri nʼime ya ụbọchị asaa ahụ niile e mere mmemme ahụ. Oke ọṅụ jupụtara obi mmadụ niile, nʼihi na site nʼoge Joshua nwa Nun ruo nʼoge a, o nwebeghị mgbe ụmụ Izrel mere mmemme a nʼụzọ dị otu a.
NEH 8:18 Ezra na-agụpụta site nʼakwụkwọ iwu Chineke kwa ụbọchị, site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị ikpeazụ. Ha mere mmemme ahụ ụbọchị asaa ma nʼụbọchị nke asatọ ha nwere ọgbakọ ofufe mmechi dịka e dere ya nʼiwu.
NEH 9:1 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke otu ọnwa ahụ, ndị Izrel niile zukọkwara na obubu ọnụ, yiri uwe iru ụjụ, kpokwasịkwa onwe ha ntụ nʼisi.
NEH 9:2 Ndị si nʼagbụrụ Izrel wezugakwara onwe ha site nʼebe ndị mba ọzọ niile nọ. Ha guzoro nʼọnọdụ ha kwupụta mmehie ha na ajọ omume nke nna nna ha.
NEH 9:3 Ha guzokwara nʼebe ahụ ha nọ gụọ site nʼakwụkwọ iwu nke Onyenwe anyị, bụ Chineke ha ruo awa atọ. Ha jikwa awa atọ nke ọzọ kwupụta mmehie ha, na ife Onyenwe anyị Chineke ha ofufe.
NEH 9:4 Mgbe ahụ Jeshua, Bani, Kadmiel, Shebanaya, Buni, Sherebaya, Bani na Kenani rigoro guzo nʼelu ihe nguzo ndị Livayị. Ha jiri oke olu kpọkuo Onyenwe anyị bụ Chineke ha.
NEH 9:5 Ndị Livayị ndị a, Jeshua, Kadmiel, Bani, Hashabneia, Sherebaya, Hodia, Shebanaya na Petahaya sịrị, “Bilienụ ọtọ, too Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-adị site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.” “Ka aha gị dị ebube bụrụ ihe a gọziri agọzi, ka ọ bụrụ ihe e buliri elu karịa ngọzị niile na otuto niile.
NEH 9:6 Gị onwe gị, naanị gị bụ Onyenwe anyị. Gị kere eluigwe, ọ bụladị eluigwe kachasị elu, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, ụwa na ihe niile dị nʼime ya, oke osimiri niile na ihe niile dị nʼime ha. Ọ bụ gị na-enye ihe niile ndụ, usuu niile nke eluigwe na-akpọkwa isiala nye gị.
NEH 9:7 “Gị, onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke ahụ, onye họpụtara Ebram site nʼobodo Ụọ nke ndị Kaldịa, kpọpụta ya, gụgharịa aha ya ka ọ bụrụ Ebraham.
NEH 9:8 Ị hụkwara nʼobi ya kwesiri ntụkwasị obi nye gị, gị na ya gbakwara ndụ na ị ga-enye ụmụ ya ala ndị Kenan, nke ndị Het, nke ndị Amọrait, nke ndị Periz, nke ndị Jebus na nke ndị Gigash. I mezuola nkwa gị nʼihi na ị bụ onye ezi omume.
NEH 9:9 “Ị hụrụ nsogbu na iru ụjụ niile nke nna nna anyị ha nʼala Ijipt; ị nụkwara akwa ha nʼakụkụ Osimiri Uhie.
NEH 9:10 I gosiri Fero na ndịisi ọchịchị ya na ndị ya niile ọtụtụ ihe ịrịbama na ọrụ ebube nʼihi na ị hụrụ otu ha siri site na nganga juru ha obi mesoo ndị gị mmeso ọjọọ. Ụwa niile maara aha gị taa nʼihi ọrụ ebube ndị a niile ị rụrụ.
NEH 9:11 I kewara Osimiri Uhie abụọ mee ka ndị gị site nʼala akọrọ gafee. Ma i mere ka ndị iro ha na-achụ ha ọsọ nwụọ nʼime oke osimiri ahụ. Ha mikpuru dịka nkume danyere nʼime mmiri, nke oke osimiri.
NEH 9:12 I ji ogidi igwe ojii duo nna nna anyị ha nʼehihie, ma were ogidi ọkụ duo ha nʼabalị, inye ha ìhè ka ha ghara ijehie ụzọ.
NEH 9:13 “I sitere nʼeluigwe gwa ha okwu, ị rịdatara nʼugwu Saịnaị, ị nyere ha iwu na ntụziaka niile ziri ezi, nyekwa ha ụkpụrụ na ihe niile dị mma nke enyere nʼiwu.
NEH 9:14 I mere ka ha mata ụbọchị izuike gị dị nsọ, nyekwa ha iwu site nʼọnụ ohu gị Mosis, ka ha debe iwu gị na ụkpụrụ gị niile.
NEH 9:15 I sitere nʼeluigwe nye ha achịcha mgbe agụụ gụrụ ha, sitekwa na nkume nye ha mmiri mgbe akpịrị kpọrọ ha nkụ. I sịkwara ha baa nʼime ala ahụ inweta ala ahụ bụ nke i weliri aka gị ṅụọ iyi inye ha.
NEH 9:16 “Ma nna nna anyị ha erubeghị isi nʼokwu gị, nʼihi isiike ha na nganga ha.
NEH 9:17 Ha egeghị ntị ọbụla, ha echetakwaghị ihe ịrịbama niile i meere ha. Kama ha nupuru isi họpụtara onwe ha onyeisi ga-eduru ha ịlaghachi Ijipt. Ma ị bụ Chineke onye na-eme ebere, onye na-agbaghara mmehie ndị gị mgbe ọbụla. Ị bụ onye obiọma, onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. I jupụtara nʼịhụnanya na amara mgbe niile. Nʼihi ya, ị gbakụtaghị ha azụ,
NEH 9:18 ọ bụladị mgbe ha meere onwe ha nwa ehi ha kpụrụ akpụ kwuo sị, ‘Nke a bụ chi unu. Ọ bụ ya si nʼala Ijipt dupụta anyị,’ maọbụ mgbe ha mehiere megide gị nʼụzọ niile.
NEH 9:19 “Ma nʼihi obi ebere gị nke dị ukwuu, ị hapụghị ha ka ha nwụọ nʼọzara. Ogidi igwe ojii ahụ duuru ha ụbọchị niile, ma ogidi ọkụ ahụ dukwara ha abalị niile.
NEH 9:20 I zitere ezi Mmụọ nke gị ime ka ha nwee uche. Ị gbochikwaghị mánà gị iru ha ọnụ, ị nyekwara ha mmiri nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ ha.
NEH 9:21 Iri afọ anọ ka i debere ha ndụ nʼọzara. Ọ dịghị ihe kọrọ ha nʼoge ahụ. Uwe ha akaghị nka, ukwu ha azaghị.
NEH 9:22 “I nyere ha alaeze na mba dị iche iche, kenye ha ọbụladị ebe ndị dịkarịsịrị anya. Ha nwetara ala Saịhọn bụ eze Heshbọn, na ala Ọg bụ eze Bashan.
NEH 9:23 I mere ka ụmụ Izrel mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe, ị kpọbatara ha nʼala ahụ i gwara ndị bụ nna ha ka ha baa nweta.
NEH 9:24 Ụmụ ha banyere nweta ala ahụ. I meriri ndị Kenan nʼihu ha, bụ ndị bi nʼala ahụ. I weere ndị Kenan ahụ nyefee nʼaka ha, ha na ndị eze ha, na ndị niile bi nʼala ahụ ka ndị gị jiri ha mee ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha.
NEH 9:25 Ndị gị nwetara ala mara mma, na ọtụtụ obodo e wusiri ike; ha nwetakwara ọtụtụ ụlọ nke ihe ọma juru nʼime ha, na olulu mmiri e gwuru nke ọma, na ubi vaịnị mkpụrụ dị, na ubi oliv, na ọtụtụ osisi ọma ndị ọzọ na-amị mkpụrụ. Ha rijuru afọ, ahụ ha mara mma ile anya, ha ṅụrikwara ọṅụ nʼihi ngọzị ị gọziri ha.
NEH 9:26 “Ma ha nupuru isi nʼokwu gị, jụ iwu gị, gbuo ndị amụma tụrụ ha mmehie ha nʼihu, meekwa ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche.
NEH 9:27 Nʼihi nke a, i nyefere ha nʼaka ndị iro ha, ndị kpagburu ha. Ma nʼime mkpagbu ha, ha kpọkuru gị, ị nọkwa nʼeluigwe nụ ekpere ha, sitekwa nʼobi ebere gị zigara ha ndị bịara zọpụta ha, na ndị napụtara ha site nʼaka ndị iro ha.
NEH 9:28 “Ma mgbe ihe bidoro ịgara ha nke ọma, ha mekwara ihe jọrọ njọ nʼihu gị. Ọzọkwa, i nyefere ha nʼaka ndị iro ha ka ndị iro ha merie ha. Ma mgbe ọbụla ndị gị chegharịkwutere gị, kpọkuo gị ka i nyere ha aka, ị na-anụ arịrịọ ha, sitekwa nʼobi ebere gị gbapụta ha.
NEH 9:29 “Ị dọrọ ha aka na ntị sị ha lọghachi debe ihe i nyere nʼiwu. Ma ha sitere na nganga juru ha obi jụ idebe iwu gị. Ha mehiere megide ihe niile i nyere nʼiwu, ọ bụ ezie na ha maara na idebe ya ga-ewetara ha ndụ. Ma site nʼisiike ha, ha gbakụtara gị azụ, bụrụ ndị isiike na ndị jụrụ ige ntị.
NEH 9:30 Ma i sitere na ntachiobi gị nye ha ogologo oge ichegharị; ị dọrọ ha aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma gị, ma ha egeghị ntị. Ya mere, i kwenyekwara ka ndị iro ha merie ha ọzọ.
NEH 9:31 Ma nʼihi obi ebere gị i bibighị ha kpamkpam; ị gbakụtakwaghị ha azụ nʼihi na ị bụ Chineke onye dị ebere na onye amara.
NEH 9:32 “Ugbu a, Chineke anyị, Chineke dị ukwuu, onye dị ike dịkwa ebube, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya, ka ọnọdụ ihe isi ike a ghara ịbụ ihe nta nʼanya gị. Ntaramahụhụ nke dakwasịrị anyị, ndị eze anyị na ndị ndu anyị, ndị nchụaja anyị, ndị amụma anyị, nna nna anyị ha na ndị gị niile, site nʼoge ndị eze Asịrịa buru ụzọ lụgbuo anyị nʼagha tutu ruo taa.
NEH 9:33 Ma gị onwe gị bụ onye ezi omume, nʼihe niile bịakwasịrị anyị; Ị mere ihe kwesiri, ebe anyị onwe anyị mere ajọ omume.
NEH 9:34 Ndị eze anyị, ndị ndụ anyị na ndị nchụaja na nna nna anyị edebeghị iwu gị; ha aṅaghịkwa ntị nʼihe niile i nyere nʼiwu maọbụ ihe ama gị nke ị dọrọ ha aka na ntị idebe.
NEH 9:35 Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼalaeze nke aka ha na-ekpori ndụ, nke oke ịdị mma gị nke ị mere ka o rute ha aka, nʼala ọma ahụ sara mbara nwere ume i nyere ha, ha efeghị gị ofufe, ha esitekwaghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
NEH 9:36 “Ma lee, anyị bụ ndị ohu taa, e, anyị bụ ndị ohu nʼala ahụ i nyere nna nna anyị ha, ka ọ bụrụ ebe ha ga-esi rie mkpụrụ ọ mịpụtara na ihe ọma ọ na-amịpụta.
NEH 9:37 Nʼihi mmehie anyị, mkpụrụ ọma niile a na-esi na ya wepụta ka ndị eze ahụ niile i mere ka ha na-achị anyị na-ewere. Ha nwere ike nʼahụ anyị, na nʼebe anụ ụlọ anyị dị ka o si dị ha mma. Anyị na-ahụjukwa anya.
NEH 9:38 “Nʼihi ihe ndị a niile, anyị na-ekwe gị nkwa ugbu a na anyị ga-efe gị. Anyị, ndịisi anyị, ndị Livayị na ndị nchụaja, na-etinye aha anyị nʼọgbụgba ndụ a.”
NEH 10:1 Ndị tinyere aka, nʼakwụkwọ ahụ bụ: Onyeisi ọchịchị: Nehemaya nwa Hakalaya. Zedekaya,
NEH 10:2 Ndị ọzọ bụ Seraya, Azaraya, Jeremaya,
NEH 10:3 Pashua, Amaraya, Malkija,
NEH 10:4 Hatush, Shebanaya, Maluk,
NEH 10:5 Harim, Meremot, Ọbadaya,
NEH 10:6 Daniel, Gineton, Baruk,
NEH 10:7 Meshulam, Abija, Mijamin,
NEH 10:8 Maazaya, Bilgai na Shemaya. Ndị a bụ ndị nchụaja.
NEH 10:9 Ndị Livayị so tinye aka ha nʼakwụkwọ bụ, Jeshua nwa Azanaya, Binui otu nʼime ụmụ Henadad, Kadmiel,
NEH 10:10 ndị so ha na-arụ ọrụ: Shebanaya, Hodia, Kelita, Pelaia, Hanan,
NEH 10:11 Mika, Rehob, Hashabaya
NEH 10:12 Zakua, Sherebaya, Shebanaya,
NEH 10:13 Hodia, Bani na Beninu.
NEH 10:14 Ndịisi ọchịchị tinyere aka ha bụ, Parosh, Pahat-Moab, Elam, Zatu, Bani,
NEH 10:15 Buni, Azgad, Bebai,
NEH 10:16 Adonaịja, Bigvai, Adin,
NEH 10:17 Atea, Hezekaya, Azoa,
NEH 10:18 Hodia, Hashum, Bezai,
NEH 10:19 Harif, Anatot, Nebai,
NEH 10:20 Magpịash, Meshulam, Hezia,
NEH 10:21 Meshezabel, Zadọk, Jadua,
NEH 10:22 Pelataya, Hanan, Anaia,
NEH 10:23 Hoshea, Hananaya, Hashub,
NEH 10:24 Halohesh, Pilha, Shobek,
NEH 10:25 Rehum, Hashabna, Maaseia,
NEH 10:26 Ahaya, Hanan, Anan,
NEH 10:27 Maluk, Harim na Baana.
NEH 10:28 “Ndị ọzọ fọdụrụ bụ ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị nche, ndị ọbụ abụ, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ndị ahụ niile sitere nʼirube isi nʼiwu Chineke wezuga onwe ha site nʼebe ndị mba ọzọ ahụ bi ha gburugburu nọ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom, bụ ndị niile tozuru ịghọta ihe.
NEH 10:29 Ndị a niile sooro ụmụnne ha ndị Izrel a na-asọpụrụ, jikọtaa onwe ha nʼọbụbụ ọnụ na ịṅụ iyi ịgbaso iwu Chineke, nke o nyere site nʼaka Mosis, bụ ohu Chineke; na ilezi anya rube isi nʼihe niile enyere nʼiwu, ntụziaka niile na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị.
NEH 10:30 “Anyị kpebikwara na ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom agaghị alụ di maọbụ nwunye site na mba ọzọ.
NEH 10:31 “Anyị kpebikwara na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ eburu ngwa ahịa ha maọbụ mkpụrụ ubi ha bịa ire ya nʼụbọchị izuike, maọbụ nʼụbọchị ọzọ dị nsọ, anyị agaghị azụ ihe ọbụla. Anyị na-ekpebikwa na anyị agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼafọ nke asaa niile, kwekọọkwa na anyị ga-agbaghara ụmụnna anyị niile ji anyị ụgwọ nʼafọ ahụ.
NEH 10:32 “Anyị kwekọrịtakwara na anyị ga-atụ ụtụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke otu shekel afọ niile maka iji kwadoo ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke,
NEH 10:33 maka ime ka ihe ndị a dịrị nʼụlọnsọ ukwu ahụ: achịcha nsọ, onyinye ọka nke ụbọchị niile, aja nsure ọkụ na onyinye nke ụbọchị izuike, mmemme ọnwa ọhụrụ niile, ha na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka, maka aja dị nsọ niile na aja ikpuchi mmehie ndị Izrel, maka ozi niile a na-aga nʼụlọnsọ Chineke anyị.
NEH 10:34 “Anyị bụ ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị ọzọ, ejirila ife nza chọpụta mgbe ezinaụlọ ọbụla nʼetiti anyị ga-eji bubata nku nʼụlọ Chineke anyị nʼoge ya kwa afọ, maka ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị Chineke anyị dịka e dere ya nʼiwu.
NEH 10:35 “Anyị kpebikwara na mmadụ niile nʼotu nʼotu ga na-ewebata mkpụrụ mbụ nke ihe ubi ya nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na mkpụrụ osisi ọbụla, maọbụ ihe ubi ndị ọzọ.
NEH 10:36 “Dịka e dere ya nʼIwu, anyị ga-ewebata ụmụ ndị ikom mbụ anyị, na nwa mbụ nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ anyị niile, nʼụlọ Chineke anyị. A ga-enye ha ndị nchụaja na-eje ozi nʼebe ahụ.
NEH 10:37 “Karịsịa, anyị ga-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ Chineke anyị, nyekwa ha ndị nchụaja, ụtụ ọka mbụ anyị kwọrọ, ya na onyinye ndị ọzọ nke mkpụrụ ubi mbụ anyị, dịka mmanya vaịnị mbụ, mmanụ oliv mbụ na mkpụrụ osisi ndị ọzọ. Anyị kpebikwara inye ndị Livayị otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile anyị nwetara nʼubi anyị, nʼihi na ọ bụ ọrụ ndị Livayị ịnakọta otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼobodo niile ebe anyị na-arụ ọrụ.
NEH 10:38 Ndị nchụaja bụ ụmụ ụmụ Erọn ga-eso ndị Livayị mgbe ha na-anakọta onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ndị a. Ha ga-ewekọta ihe ndị a niile webaa ha nʼụlọ Chineke anyị, ruo nʼime ọnụụlọ ịchịkọba ihe, nke ụlọakụ.
NEH 10:39 Ndị Izrel na ndị Livayị, kwesiri iweta onyinye ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv nʼime ụlọ ịchịkọba ihe, nʼebe a na-edebe ngwongwo niile e ji eje ozi nʼụlọ ukwu ahụ, nke ndị nchụaja na-eje ozi, ndị nche na nke ndị ọbụ abụ. “Anyị agaghị agbakụtakwa ụlọ Chineke anyị azụ.”
NEH 11:1 Ugbu a, ndịisi Izrel bi nʼobodo nsọ Jerusalem nʼoge a, ma e sitere nʼife nza họpụta otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ndị bi nʼobodo ndị ọzọ niile ka ha bịa biri na Jerusalem, bụ obodo nsọ ahụ, ebe ụzọ itoolu fọdụrụ bikwa nʼobodo nke aka ha.
NEH 11:2 Ndị mmadụ toro ndị niile jiri afọ ofufu họrọ ịbịa soro biri na Jerusalem.
NEH 11:3 Ndị a bụ ndịisi ala ahụ a na-achị achị ndị bịara biri na Jerusalem (ma ọtụtụ ndị Izrel, ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi biiri nʼobodo Juda, onye ọbụla nʼihe onwunwe ya nʼobodo ha dị iche iche.
NEH 11:4 Ebe ndị ọzọkwa bụ ndị sitere na Juda na Benjamin, biiri na Jerusalem). Ndị sitere nʼagbụrụ Juda bụ ndị a: Ataia nwa Uzaya, nwa Zekaraya, nwa Amaraya, nwa Shefataya, nwa Mahalalel, nwa Perez;
NEH 11:5 na Maaseia nwa Baruk, nwa Kol-Hoze, nwa Hazaia, nwa Adaya, nwa Joiarib, nwa Zekaraya, nwa onye Shilo.
NEH 11:6 Ọnụọgụgụ ụmụ Perez niile bi na Jerusalem dị narị anọ, na iri isii na asatọ (468). Ha bụ ndị ikom gbara dimkpa.
NEH 11:7 Ndị sitere nʼagbụrụ Benjamin bụ, Salu nwa Meshulam, nwa Joed, nwa Pedaia, nwa Kolaya, nwa Maaseia, nwa Itiel, nwa Jeshaya,
NEH 11:8 ya na ndị na-eso ya bụ ụmụ Gabai na Salai. Ọnụọgụgụ ha dị narị itoolu na iri abụọ na asatọ (928).
NEH 11:9 Juel nwa Zikri bụ onyeisi ha. Juda nwa Hasenua bụ onye na-eso ya, na onye na-achị akụkụ ọhụrụ nke obodo ahụ.
NEH 11:10 Ndị sitere nʼetiti ndị nchụaja bụ, Jedaya nwa Joiarib, na Jakin,
NEH 11:11 na Seraya nwa Hilkaya, nwa Meshulam, nwa Zadọk, nwa Meraiot, nwa Ahitub onye na-elekọta ụlọ ukwuu Chineke.
NEH 11:12 Ọnụọgụgụ ndị ikom ha na ha na-arụkọ ọrụ nʼụlọ ukwu ahụ bụ narị asatọ na iri abụọ na abụọ (822). Adaya, nwa Jeroham, nwa Pelalaya, nwa Amzi, nwa Zekaraya, nwa Pashua nwa Malkija,
NEH 11:13 na ndị ikom bụ ndịisi ezinaụlọ ndị so ya rụọ ọrụ dị narị abụọ na iri anọ na abụọ (242) nʼọnụọgụgụ, Amashaị nwa Azarel, nwa Ahazai, nwa Meshilemot, nwa Imea,
NEH 11:14 na ndị otu ya nʼọrụ ndị bụkwa dimkpa, dị otu narị na iri abụọ na asatọ (128) nʼọnụọgụgụ. Onyeisi ha bụ Zabdiel nwa Hagedolin.
NEH 11:15 Site na ndị Livayị: Shemaya nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaya, nwa Buni,
NEH 11:16 na Shabetai, na Jozabad, mmadụ abụọ na ndị ndu ndị Livayị, ndị ọ bụ ha na-arụ ọrụ dị nʼezi nke ụlọ Chineke;
NEH 11:17 Matanaya nwa Mika, nwa Zabdi, nwa Asaf, bụ onyendu nke duru nʼekpere na ofufe ekele. Bakbukaya onye nke abụọ nʼetiti ndị otu ya, na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun, bụ ndị na-enyere ya aka.
NEH 11:18 Ọnụọgụgụ ndị Livayị niile nọ na obodo nsọ ahụ dị narị abụọ na iri asatọ na anọ (284).
NEH 11:19 Ndị nche ọnụ ụzọ ama, Akub, Talmon na ndị otu ha dị otu narị na iri asaa na abụọ (172) nʼọnụọgụgụ, ha bụ ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama niile.
NEH 11:20 Ndị fọdụrụ nʼIzrel, ha na ndị nchụaja, na ndị Livayị, nọ nʼobodo Juda niile, onye ọbụla nʼihe nketa ya.
NEH 11:21 Ndị ahụ niile na-eje ozi nʼụlọnsọ bi nʼugwu Ofel. Ndịisi ha bụ Ziha na Gishpa.
NEH 11:22 Onye na-elekọta ndị Livayị bi na Jerusalem bụ Uzi, nwa Bani, nwa Hashabaya, nwa Matanaya, nwa Matanaia, nwa Mika. Uzi bụ otu onye si nʼikwu Asaf, ndị ọbụ abụ maka ije ozi nke ụlọ Chineke.
NEH 11:23 Eze họpụtara ndị ọbụ abụ nyekwa ha ọrụ ha kwesiri ịrụ ụbọchị niile.
NEH 11:24 Petahaya nwa Meshezabel, onye bụ otu nʼagbụrụ Zera, nwa Juda, bụ onyeozi eze banyere ihe niile gbasara ndị mmadụ ahụ.
NEH 11:25 Obodo ụfọdụ ebe ndị Juda bi bụ ndị a: Kiriat Aba, Dibọn, Jekabzeel na obodo nta ndị dị ha gburugburu,
NEH 11:26 Jeshua, Molada, Bet-Pelet,
NEH 11:27 Haza Shual, Bịasheba na obodo ya niile,
NEH 11:28 Ziklag, Mekona na obodo ya niile,
NEH 11:29 En-Rimọn, Zora, Jamut,
NEH 11:30 Zanoa, Adulam na obodo nta dị ha gburugburu, Lakish, ala dị ya gburugburu, Azeka na obodo ya niile. Nke a pụtara na ndị mmadụ bi site na Bịasheba ruo na Ndagwurugwu Hinom.
NEH 11:31 Ndị agbụrụ Benjamin biri na Geba, Mikmash, Aija, Betel na obodo dị ya gburugburu,
NEH 11:32 Anatot, Nob, Ananaya,
NEH 11:33 Hazọ, Rema, Gitaim,
NEH 11:34 Hadid, Zeboim, Nebalat,
NEH 11:35 Lod, Ono na Ge Harashim.
NEH 11:36 Ụfọdụ nʼotu ndị Livayị, ndị ebe obibi ha dị na Juda ka e zigara isoro biri nʼebo Benjamin.
NEH 12:1 Ndị a bụ ndị nchụaja na ndị Livayị ndị so Zerubabel nwa Shealtiel na Jeshua lọta. Seraya, Jeremaya, Ezra,
NEH 12:2 Amaraya, Maluk, Hatush,
NEH 12:3 Shekanaya, Rehum, Meremot,
NEH 12:4 Ido, Gineton, Abija
NEH 12:5 Mijamin, Maadaya, Bilga,
NEH 12:6 Shemaya, Joiarib, Jedaya,
NEH 12:7 Salu, Amok, Hilkaya na Jedaya. Ndị a niile bụ ndị ndu ndị nchụaja na ndị na-enyere ndị ndụ aka nʼụbọchị Jeshua.
NEH 12:8 Ndị Livayị so ha bụ ndị a: Jeshua, Binui, Kadmiel, Sherebaya, Juda nakwa Matanaya, onye ya na ndị otu ya na-elekọta ofufe ekele.
NEH 12:9 Bakbukaya, na Unni, ndị otu ha nọ na ncherita ihu nʼofufe ahụ.
NEH 12:10 Jeshua mụrụ Joiakim, Joiakim mụrụ Eliashib, Eliashib mụrụ Joiada,
NEH 12:11 Joiada mụrụ Jonatan, ebe Jonatan mụrụ Jadua.
NEH 12:12 Ndị a bụ ndịisi ikwu ndị nchụaja nʼoge ndụ Joiakim. Meraia bụ onyeisi ụmụ Seraya, Hananaya bụ onyeisi ụmụ Jeremaya,
NEH 12:13 Meshulam bụ onyeisi ụmụ Ezra, Jehohanan, onyeisi ụmụ Amaraya;
NEH 12:14 Jonatan, onyeisi ụmụ Maluk; Josef bụ onyeisi ụmụ Shekanaya;
NEH 12:15 nke Harim, Adna, nke Meremot, Helkai;
NEH 12:16 Zekaraya, onyeisi ụmụ Ido; Meshulam, onyeisi ụmụ Gineton
NEH 12:17 Zikri, onyeisi ụmụ Abija; Piltai, onyeisi ụmụ Modaya na Miniamin
NEH 12:18 Shamua, onyeisi ụmụ Bilga, Jehonatan, onyeisi ụmụ Shemaya;
NEH 12:19 Matenai, onyeisi ụmụ Joiarib; Uzi, onyeisi ụmụ Jedaya;
NEH 12:20 Kalai, onyeisi ụmụ Salu; Eba, onyeisi ụmụ Amok,
NEH 12:21 Hashabaya, onyeisi ụmụ Hilkaya; Netanel, onyeisi ndị Jedaya.
NEH 12:22 E dekọtara aha ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị niile nʼụbọchị Eliashib, Joiada, Johanan na Jadua, nakwa nke ndị nchụaja nʼakwụkwọ nʼoge ọchịchị Daraiọs bụ eze Peshịa.
NEH 12:23 E dekwara aha ndịisi ndị Livayị niile nʼakwụkwọ tutu ruo nʼoge Johanan nwa Eliashib dị ndụ.
NEH 12:24 Ndị a bụ ndịisi ndị Livayị nʼoge ahụ: Hashabaya, Sherebaya, Jeshua, nwa Kadmiel na ndị otu ha. Ha kere onwe ha ụzọ abụọ. Ụzọ abụọ ndị a na-eguzokwa na-eche ibe ha ihu mgbe ọbụla ha na-abụku Chineke abụ otuto na ekele. Otu ụzọ na-amalite nke ọzọ azaghachi, dịka Devid onye nke Chineke si nye ya nʼiwu.
NEH 12:25 Ndị nche na-eche ọnụ ụzọ ụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ bụ ndị a: Matanaya, Bakbukaya, Ọbadaya, Meshulam, Talmon na Akub.
NEH 12:26 Ha jere ozi ha nʼoge Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, dị ndụ, na nʼoge Nehemaya bụ onyeisi ọchịchị, na nʼoge Ezra bụkwa onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke.
NEH 12:27 Mgbe a na-edo mgbidi Jerusalem ọhụrụ ahụ nsọ, e sitere nʼobodo niile ndị Livayị bi kpọọ ha ka ha bịa nye aka iji ọṅụ mee mmemme ido nsọ ahụ. Ha bịakwara jiri abụ ekele na ihe egwu dị iche iche dịka ụbọ akwara, ịgba na une kelee Chineke.
NEH 12:28 Ndị ọbụ abụ sitekwara nʼobodo niile dị gburugburu Jerusalem bịa, ọ bụladị site nʼobodo niile ndị Netofa,
NEH 12:29 na Bet-Gilgal, na akụkụ Geba na Azmavet, nʼihi na ha ewuorola onwe ha obodo nta dị iche iche gburugburu Jerusalem.
NEH 12:30 Mgbe ndị nchụaja na ndị Livayị dochara onwe ha ọcha, ha dokwara ndị Izrel niile, na ọnụ ụzọ ama niile, na mgbidi ahụ ọcha.
NEH 12:31 E mere m ka ndị ndu Juda niile rigoro nʼelu mgbidi ahụ. Nʼebe ahụ ka m kenyere otu ndị ọbụ abụ abụọ inye ekele. Otu ụzọ gara akụkụ aka nri nke elu mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Ikpofu Ahịhịa.
NEH 12:32 Hoshaya na ọkara ndị ndu Juda na-eso ha nʼazụ,
NEH 12:33 ha na Azaraya, Ezra, Meshulam,
NEH 12:34 Juda, Benjamin, Shemaya, Jeremaya
NEH 12:35 na ndị nchụaja ndị a ndị na-afụ opi, tinyere Zekaraya nwa Jonatan, nwa Shemaya. Ndị bụ nna nna Zekaraya bụ Matanaya, Mikaya na Zakua, ndị ikwu Asaf.
NEH 12:36 Ndị otu ya, bụ Shemaya, Azarel, Milalai, Gilalai, Maai, Netanel, Juda na Hanani. Ha niile ji ngwa egwu ha, ụdị ngwa egwu ndị ahụ Devid onye nke Chineke nyere nʼiwu na ndị ọbụ abụ ga-eji. Ezra, bụ ode akwụkwọ nọ nʼihu na-edu ha.
NEH 12:37 Mgbe ha rutere nʼỌnụ Ụzọ ama Isi Iyi, ha rigooro nʼelu nkwasa nrigo ụlọ elu e si abata nʼobodo Devid, si ebe ahụ gafee ụlọeze Devid, gaakwa lọghachi nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ.
NEH 12:38 Ndị ọbụ abụ nke ọzọ bụ ndị na-enye ekele gara ụzọ aka ekpe. Mụ onwe m sooro ha nʼelu mgbidi ahụ, tinyere ọkara ndị mmadụ ahụ, gafee Ụlọ elu Ite Ọkụ jeruo Mgbidi Sara Mbara.
NEH 12:39 Anyị sitekwara nʼebe ahụ gafee Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem, Ọnụ Ụzọ ama Jeshana, Ọnụ Ụzọ Ama Azụ, Ọnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Hananel, ruokwa nʼỌnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Narị na ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ, kwụsị nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndị Nche.
NEH 12:40 Ya mere, ụzọ ndị mmadụ abụọ na-abụ abụ ekele nye Chineke zukọtara bata nʼụlọnsọ ukwu. Esokwa m ha bata, mụ na ọkara ndị ndu,
NEH 12:41 tinyere ndị nchụaja ndị a: Eliakịm, Maaseia, Miniamin, Mikaya, Elioenai, Zekaraya na Hananaya. Ndị a niile ji opi ha.
NEH 12:42 Ndị ọzọ sokwa bata bụ ndị a: Maaseia, Shemaya, Elieza, Uzi, Jehohanan, Malkija, Elam na Eza. Onyendu ndị ọbụ abụ ahụ niile bụ Jezrahaya.
NEH 12:43 Ha chụrụ ọtụtụ aja nʼụbọchị ahụ nʼihi na Chineke nyere ha oke ọṅụ. Ụmụnta na ndị inyom sokwa ṅụrịa ọṅụ. Ha nụkwara ụda ọṅụ ndị Jerusalem site nʼebe dị anya.
NEH 12:44 Nʼoge ahụ ka a họpụtara ndị ikom na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe, ebe a na-achịkọba onyinye mkpụrụ mbụ, na onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri. A na-esite nʼobodo gbara Jerusalem gburugburu na-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe onyinye niile e nyere nʼiwu maka ọdịmma ndị nchụaja na ndị Livayị. E si otu a na-ewebata ya nʼihi na ọrụ ndị nchụaja na ndị Livayị na-arụ na-atọ ndị Juda ụtọ nke ukwuu.
NEH 12:45 Nʼihi na ha na-arụ ọrụ Chineke ahụ ha ketara ịrụ, ya na ọrụ ido ndị mmadụ na ihe ọbụla nsọ. Otu a kwa ka ndị ọbụ abụ, na ndị na-eche nche sị arụkwa ọrụ a dịka iwu Devid na Solomọn nwa ya nyere si dị.
NEH 12:46 Ọ bụ nʼoge Devid na Asaf ka e bidoro inwe ndị ndu abụ ito na ikele Chineke.
NEH 12:47 Ya mere, nʼoge Zerubabel na Nehemaya, ndị Izrel niile na-ewebata onyinye e ji akwagide ọrụ ndị ọbụ abụ, na ndị nche, na ndị Livayị. Ha kewapụtakwara oke ruru ndị Livayị ndị ọzọ iche, ndị Livayị nʼonwe ha kwa, kewapụtara oke ruru ụmụ Erọn nʼime ihe e nyere ha dịka e si nye ya nʼiwu.
NEH 13:1 Nʼụbọchị ahụ, a gụpụtara okwu Chineke na ntị ndị Izrel site nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mgbe a na-agụpụta ya, a chọpụtara na o megidere iwu na onye Amọn, maọbụ onye Moab, ga-eso nʼofufe ụlọnsọ ukwu Chineke.
NEH 13:2 Nʼihi na ha bụ ndị iro ụmụ Izrel. Ha enyeghị ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ kama ha zụrụ Belam ka ọ bụọ ụmụ Izrel ọnụ. (Ma Chineke anyị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọ ngọzị.)
NEH 13:3 Mgbe a gụpụtara iwu a, ndị Izrel chụpụrụ ndị mba ọzọ niile nọ nʼọgbakọ ha.
NEH 13:4 Ma tupu ihe ndị a niile emee, Eliashib onye bụ onye nchụaja, onye e doro nʼisi ilekọta ime ụlọ a na-achịkọba ihe nʼụlọ Chineke anyị, ya na Tobaya nwee ezi mmekọrịta,
NEH 13:5 o weere otu ọnụụlọ buru ibu a na-achịkọba ihe nye ya. Na mbụ, ọ bụ ọnụụlọ ebe a na-achịkọta onyinye ọka na ụda na-esi isi ụtọ, na ngwongwo ụlọnsọ, na efere mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv. Mosis enyelarị ya nʼiwu na ọ bụ ndị Livayị na ndị ọbụ abụ na ndị nche nwe onyinye ndị ahụ. Ndị nchụaja nwekwa oke nʼihe ndị a.
NEH 13:6 Mgbe ihe ndị a na-eme, anọghị m na Jerusalem, nʼihi na nʼiri afọ atọ na abụọ nke ọchịchị Ataksekses, eze Babilọn, a lọghachikwutere m eze. Ma e mesịrị m nata ya ike
NEH 13:7 laghachikwa na Jerusalem. Nʼebe a ka m nọ mata banyere ihe ọjọọ ahụ Eliashib mere, inye Tobaya otu ọnụụlọ nke dị nʼogige ụlọ Chineke ka ọ bụrụ ebe izuike ya.
NEH 13:8 Iwe were m nke ukwuu, nke mere na m sitere nʼọnụụlọ ahụ tụpụsịa ngwongwo Tobaya niile nʼezi.
NEH 13:9 Enyere m iwu ka e doo ọnụụlọ ndị ahụ niile ọcha, a chighachikwara m ngwongwo ụlọ Chineke niile nʼime ha, ha na onyinye mkpụrụ ọka, na ụda na-esi isi ụtọ ndị ahụ.
NEH 13:10 A chọpụtakwara m na-enyebeghị ndị Livayị oke ihe ruru ha, nke mere na ndị ọbụ abụ, na ndị nche ndị ọ bụ ọrụ ha i doo ofufe, alaghachila nʼubi ha dị iche iche.
NEH 13:11 Nʼihi ya, abaara m ha mba jụọ ha si: “Gịnị mere unu jiri gbakụta ụlọnsọ ukwu Chineke azụ?” Mgbe ahụ akpọghachiri m ndị Livayị nyekwa ha ọrụ ha nʼụlọnsọ.
NEH 13:12 Ndị Juda niile bidokwara iweta ụtụ ha, na onyinye ọka, na mmanya vaịnị na mmanụ oliv ha nʼụlọ ịchịkọba ihe dị nʼụlọnsọ.
NEH 13:13 E tinyere m Shelemaya onye nchụaja, na Zadọk ode akwụkwọ, na Pedaia onye Livayị, ka ha bụrụ ndị na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe niile ahụ. Emekwara m Hanan nwa Zakua, nwa Matanaya, onye ga na-enyere ha aka, nʼihi na a gụrụ ha dịka ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ọrụ ha bụ ikere ndị Livayị ibe ha niile oke.
NEH 13:14 Chineke m, biko cheta m nʼihi nke a, ehichapụkwala ihe niile m ji obi m niile rụọ nʼụlọnsọ gị na ije ozi niile ya.
NEH 13:15 Nʼụbọchị ndị ahụ, ka m hụrụ na Juda ndị na-azọcha mmanya vaịnị nʼụbọchị izuike, ndị ji ịnyịnya ibu na-ebubata ogbe ọka, na-ebokwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu, tinyekwara mmanya, na mkpụrụ vaịnị na fiig, na ibu niile ọbụla. Ha na-ebubatakwa ha nʼime Jerusalem nʼụbọchị izuike. Nke a mere m ji dọọ ha aka na ntị megide ire nri nʼụbọchị ahụ.
NEH 13:16 Ndị si obodo Taịa, bụ ndị birila na Jerusalem nọ na-ebubata azụ na ngwa ahịa ndị ọzọ dị iche iche, na-ere ha na Juda, nakwa na Jerusalem nʼụbọchị izuike.
NEH 13:17 A baara m ndị a na-asọpụrụ na Juda mba, si ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a unu na-eme, na-emerụ ụbọchị izuike?
NEH 13:18 Ọ bụghị otu ihe a ka nna nna unu ha mere, nke mere na Chineke wetara ọdachi a tụkwasị anyị nakwa obodo a? Ugbu a, unu na-akpali ọnụma tụkwasị na nke dị megide Izrel site nʼimerụ ụbọchị izuike?”
NEH 13:19 Nʼihi nke a, enyere m iwu na a ga-emechi ọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼuhuruchi tupu ụbọchị izuike, ruo mgbe ụbọchị izuike gafesịrị. Emere m ka ụfọdụ ndị ohu m na-anọ na nche nʼebe ahụ, ịhụ na ọ dịghị onye ahịa ọbụla ga-abata nʼime obodo Jerusalem nʼụbọchị izuike.
NEH 13:20 Ya mere, ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ụdị ngwa ahịa dị iche iche, na-anọ ọnọdụ abalị nʼazụ Jerusalem, otu gboro maọbụ ugboro abụọ.
NEH 13:21 Ma a dọrọ ha aka na ntị, sị, “Gịnị ka unu ji na-anọ ọnọdụ abalị nʼakụkụ mgbidi a? Ọ bụrụ na unu eme ya ọzọ, aga m enye iwu ka e jide unu.” Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ha abịakwaghị ọzọ nʼụbọchị izuike.
NEH 13:22 Mgbe ahụ, enyere m ndị Livayị iwu ka ha doo onwe ha ọcha, nọọkwa na nche nʼọnụ ụzọ ama, ịhụ na onye ọbụla doro ụbọchị izuike nsọ. Chineke m, biko, cheta m nʼihi ihe ọma ndị a niile, nwee amara nʼebe m nọ, dịka ịba ụba nke obi ebere gị si dị.
NEH 13:23 Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ a hụrụ m ndị ikom Juda ndị lụtara ndị inyom site nʼetiti ndị Ashdọd, na ndị Amọn, na ndị Moab,
NEH 13:24 chọpụtakwa na ọkara nʼetiti ụmụ ha na-asụ naanị asụsụ ndị Ashdọd, maọbụ otu asụsụ nke ndị mba ọzọ, ma ha amaghị asụsụ Juda ma ọlị.
NEH 13:25 Ya mere, abaara m ha mba, bụkwaa ha ọnụ. Ụfọdụ ha ka m tiri ihe, dọọkwa ha nʼagịrị isi. Emesịa, emere m ka ha ṅụọ iyi nʼaha Chineke si: “Unu agaghị ekwekwa ka ụmụ ndị ikom na ndị inyom unu lụọ ndị mba ọzọ ma unu onwe unu agakwaghị alụtara ụmụ unu, maọbụ onwe unu, ndị inyom ndị mba ọzọ.
NEH 13:26 Ọ bụghị ọlụlụ di na nwunye dị otu a wetara ọdịda Solomọn? O nweghị eze ọzọ dị na mba ọbụla a pụrụ iji tụnyere Solomọn, nʼihi na Chineke ya hụrụ ya nʼanya mee ya eze ndị Izrel niile. Ma ọ bụ ndị nwunye mba ọzọ ọ lụrụ dubara ya na mmehie ikpere arụsị.
NEH 13:27 Ugbu a, ọ bụ ka anyị gere na ntị na unu onwe unu na-emekwa ajọ ihe dị otu a, na unu ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke anyị, site nʼịlụ ndị inyom ndị mba ọzọ?”
NEH 13:28 Ya mere, esitere m nʼebe m nọ chụpụ otu nʼime ụmụ ndị ikom Joiada, nwa Eliashib, onyeisi nchụaja, onye bụ ọgọ Sanbalat onye Hor.
NEH 13:29 Cheta ha, Chineke m, nʼihi na ha merụrụ ọrụ nchụaja, na ọgbụgba ndụ ọrụ nchụaja, na nke ndị Livayị.
NEH 13:30 Ya mere, e doro m ndị nchụaja, na ndị Livayị ọcha, wezugakwa ihe ọbụla nke na-ekwesighị nʼebe ha nọ. E kenyere m ha ọrụ, onye ọbụla nʼije ozi ya.
NEH 13:31 Emekwara m ka a na-ebubata nkụ nke ebe ịchụ aja nʼoge kwesiri, meekwa ka a na-ewebata onyinye mkpụrụ mbụ niile nʼoge ha. Cheta m Chineke, gosi m ihuọma gị.
EST 1:1 Nke a bụ ihe mere nʼoge ọchịchị eze Sekses, bụ Sekses nke chiri alaeze nwere mpaghara dị iche iche nke karịrị otu narị na iri abụọ na asaa (127), nke gbasakwara site nʼIndia rụọ Kush.
EST 1:2 Nʼoge ahụ, isi ọchịchị obodo eze Sekses bụ Susa ebe ocheeze ya dịkwa.
EST 1:3 Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o mere mmemme oke oriri nye ndịisi ọrụ ya niile. Ndị ọzọ ọ kpọkwara bụ ndịisi agha nke Peshịa na Midia, na ụmụ eze, na ndị ọchịchị sitere na mba dị iche iche ọ na-achị.
EST 1:4 Mmemme a were otu narị na iri ụbọchị asatọ (180). Eze jikwa oge a gosi akụnụba, na ịma mma na ebube nke alaeze ya.
EST 1:5 Mgbe ụbọchị ndị a gafesịrị, eze kpọrọ oke oriri nọrọ ụbọchị asaa nʼubi a gbara ogige dị nʼụlọeze, nye ndị niile nọ na Susa, site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta.
EST 1:6 Ihe ịchọ mma e ji dozie ogige ahụ bụ ezi akwa mgbochi dị ọcha, nke e ji ogho ọcha kpaa na nke e jikwa ogho na-acha anụnụ anụnụ kpaa. E jikwa eriri ogho dị ezi ọcha na nke na-acha odo odo kekọtaa akwa mgbochi ndị ahụ, nʼihe mgbaaka ọlaọcha dị nʼogidi nkume dị oke ọnụahịa e wuru nʼebe ahụ. A dọbakwara oche ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ nʼebe e wulitụrụ elu, nke e ji nkume mabụl na nkume ndị ọzọ dị oke ọnụahịa, ndị na-acha ezi ọcha, ndị na-acha odo odo na nke na-eji oji wuo ala ya.
EST 1:7 E jikwa iko ọlaedo ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Iko ọlaedo ọbụla e wepụtara nʼụbọchị ahụ dị iche nʼiche. O nweghị nke yiri ibe ya. E mekwara ka mmanya eze baa ụba dịka afọ ọma aka eze si dị.
EST 1:8 E nyeghịkwa iwu ọbụla banyere iko mmanya ole mmadụ kwesiri ịṅụ kama ndị chọrọ ga-aṅụ dịka o si masị ha. Nʼihi na eze agwalarị ndịisi ozi ya na onye ọbụla kwesiri ịṅụ dịka o si chọọ.
EST 1:9 Nʼotu oge ahụ, eze nwanyị Vashti, kpọkwara oke oriri nye ụmụ nwanyị niile nọ nʼụlọeze, Sekses.
EST 1:10 Nʼụbọchị nke asaa, mgbe obi dị eze Sekses mma nʼihi mmanya ọ ṅụrụ, ọ nyere ndị onozi asaa ndị a na-ejere ya ozi iwu, ha bụ, Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas,
EST 1:11 sị ha gaa kpọọ Vashti nwunye eze ka ọ bịakwute ya. Eze nyekwara iwu ka Vashti kpuru okpueze nʼisi ya, maka igosi ndị mmadụ niile na ndị a na-asọpụrụ nọ nʼebe ahụ ịma mma ya. Nʼihi na Vashti mara mma.
EST 1:12 Ma mgbe e mere ka ozi eze ruo ya ntị, eze nwanyị, bụ Vashti jụrụ ịbịa. Nke a mere ka iwe wee eze nke ukwuu.
EST 1:13 Dịka eze Sekses na-eme, ọ kpọkwara ndị ọkachamara nʼihe gbasara iwu na ikpe ziri ezi. Eze na ndị a mara ihe, bụ ndị maara ihe ụbọchị nyere kparịtara ụka.
EST 1:14 Ha bụkwa ndị na-anọkarị eze nso. Aha ha bụ Kashena, na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan. A maara aha mmadụ asaa ndị a nʼala Midia na Peshịa. Ha bụ ndị na-aga nʼihu eze mgbe ọbụla ha chọrọ, bụrụkwa ndị dịkarịsịrị elu nʼalaeze ahụ.
EST 1:15 Eze jụrụ sị, “Dịka iwu si dị, gịnị ka a ga-eme Vashti bụ nwunye eze nʼihi na o nupuru isi nʼiwu eze Sekses nyere nke o zigaara ya site nʼọnụ ndị onozi ya?”
EST 1:16 Memukan kwuchitere ọnụ ndị ọzọ sị, “Ihe Vashti nwunye eze mere jọrọ njọ. O mehiela eze, mehiekwa ndị ọchịchị niile, na ndị niile bi nʼakụkụ niile nke alaeze Sekses.
EST 1:17 Nʼihi na ndị inyom niile ga-amata ihe eze nwanyị mere, malite ilelị ndị di ha anya, ma na-ekwu sị, ‘Eze Sekses nyere Vashti nwunye ya iwu ka ọ bịa nʼihu ya, ma ọ jụrụ ịbịa.’
EST 1:18 Nʼụbọchị taa ka ndị inyom ndịisi nke Peshịa na Midia, bụ ndị nụrụ banyere omume nwunye eze mere, ga-azakwa ndịisi ọchịchị alaeze gị nʼụzọ dị otu a. A ga-enwe nleda anya na esemokwu nʼala a mgbe niile.
EST 1:19 “Ya mere, ọ bụrụ na ọ masị eze, ya nye iwu, nke a ga-edepụta, ka ọ bụrụ iwu nʼala Peshịa na Midia, nke na-agaghị agbanwe, na Vashti agaghị abatakwa nʼihu eze Sekses ọzọ. Ka eze werekwa ọnọdụ eze nwanyị ahụ nye onye ọzọ ka ya mma.
EST 1:20 Ọ ga-erukwa na mgbe a gụpụtara iwu a eze nyere nʼakụkụ alaeze a niile, ndị inyom niile ga-asọpụrụ ndị di ha site nʼonye dịkarịsịrị nta nʼetiti ha ruo nʼonye dị ukwuu.”
EST 1:21 Eze na ndịisi ọchịchị ya nabatara ndụmọdụ a, nʼihi ya, eze mere ihe Memukan kwuru.
EST 1:22 O zipụrụ akwụkwọ ozi a nye akụkụ niile a na-achị achị nke alaeze ahụ. E dekwara akwụkwọ ozi ahụ nʼasụsụ dị iche iche, na-ekwupụta nʼasụsụ ọbụla na nwoke ọbụla kwesiri ịbụ onye na-achị ezinaụlọ ya.
EST 2:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ka iwe eze Ahasuerọs dajụrụ, ọ malitere iche echiche banyere Vashti. O chetara ihe Vashti mere, chetakwa ihe e kpebiri banyere ya.
EST 2:2 Mgbe ahụ, ndị na-ejere eze ozi sịrị ya, “Ka anyị gaa chọtara eze ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke mara mma ile anya.
EST 2:3 Ka eze họpụta ndị nchịkọta nʼisi obodo niile, ndị ga na-ahọpụta, ma na-akpọbatakwa ụmụ agbọghọ ndị a niile mara mma, nʼụlọeze dị na Susa. Ka Hegai, onozi eze bụrụkwa onye ga-elekọta ndị inyom ndị a. Ka e jirikwa ihe ịchọ mma niile chọọ ha mma dịka o si kwesi.
EST 2:4 Emesịa, nwaagbọghọ ahụ ihe ya masịrị eze karịa ga-abụ nwunye eze nʼọnọdụ Vashti.” Ntụpụta a tọrọ eze ụtọ nke ukwuu. O nyere ha ike ka ha malite na-atụfughị mgbe.
EST 2:5 Nʼoge a, enwere otu onye Juu nọ nʼobodo Susa nke ewusiri ike, a na-akpọ Mọdekai nwa Jaịa, nwa Shimei, nwa Kish, onye Benjamin.
EST 2:6 Ọ bụ onye a dọtara nʼagha mgbe Nebukadneza bibiri Jerusalem. Nʼoge ahụ, e mere ka ọ hapụ obodo ya gaa biri na Babilọn bụkwa oge a dọtakwara Jekonaya eze ndị Juda na ọtụtụ ndị ọzọ nʼagha.
EST 2:7 Mọdekai nwere nwa nwanne nna ya, aha ya bụ Hadasa, ma a na-akpọkwa ya Esta, onye mara mma nʼahụ dịkwa mma ile anya. Nne ya na nna ya anwụọla, ma Mọdekai kpọbatara ya nʼụlọ ya zụọ ya dịka nwa ya nwanyị.
EST 2:8 Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze nyere, e mere ka ọtụtụ ụmụ agbọghọbịa bịa na Susa, nʼime ụlọ ukwu eze. Ọ bụkwa Hegai na-elekọta ha niile. A kpọbatakwara Esta nʼụlọeze nyefee ya Hegai nʼaka, onye na-elekọta ebe obibi ndị iko nwanyị eze.
EST 2:9 Ọ masịrị ya, ọ natakwara ihuọma nʼebe ọ nọ. Ngwangwa ọ malitere inye ya nri pụrụ iche, na ihe ndị ahụ niile e ji edozi ahụ na ịchọ mma. O sitere nʼetiti ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọeze họpụta ụmụ agbọghọ asaa ndị na-ejere Esta ozi. O duuru ya na ndị na-ejere ya ozi dubaa nʼebe kachasị mma nʼogige ebe ndị inyom eze bi.
EST 2:10 Ma Esta agwabeghị onye ọbụla obodo ya maọbụ ihe banyere ezinaụlọ ya, nʼihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara ịgwa onye ọbụla.
EST 2:11 Ụbọchị niile, Mọdekai na-abịa nʼogige ụlọ ndị inyom na-ajụ ase otu Esta mere, nʼịchọpụta otu ihe si agara ya.
EST 2:12 Tupu o ruoro nwaagbọghọ ọbụla ibakwuru eze Sekses, ọ ga-anọzu ọnwa iri na abụọ nʼebe a na-achọ ya mma dịka iwu e nyere banyere ịchọ mma ndị inyom si dị. A ga-eji mmanụ máá chọọ ya mma ọnwa isii, werekwa mmanụ isi ụtọ dị iche iche, na ihe ịchọ mma ndị ọzọ kwadoo ya nʼime ọnwa isii nke ọzọ.
EST 2:13 Nʼụzọ dị otu a, ka nwaagbọghọ ọbụla ga-adị gakwuru eze, bụ Sekses. A na-enye ya ihe ọbụla ọ chọrọ site nʼebe obibi ha nke o ji aba nʼụlọeze.
EST 2:14 A na-eme ka ọ banye nʼụlọeze nʼanyasị, ma nʼụtụtụ, ọ na-alọghachi nʼụlọ ọzọ nke dị nʼebe ụmụ nwanyị eze bi. Nʼebe ahụ ka Shashgaz, onozi eze nọ na-elekọta ndị iko nwanyị eze. Ọ gakwaghị alọghachi nʼebe eze ọzọ karịakwa ma ihe ya ọ masịrị eze, eze akpọọ ya ka ọ bịaghachi ọzọ.
EST 2:15 Mgbe oge Esta (ada Abihail, onye bụ nwanne nna Mọdekai, onye kpọọrọ nwantakịrị nwaagbọghọ a ka ọ bụrụ nwa nke ya) ga-eji gaa nʼihu eze ruru, ọ nabatara ndụmọdụ Hegai, onozi ahụ na-elekọta ndị inyom. Ọ hụtara amara nʼihu mmadụ niile ndị hụrụ ya.
EST 2:16 E mere ka Esta bakwuru eze nʼọnwa nke iri nʼafọ nke asaa nke ọchịchị eze Ahasuerọs.
EST 2:17 Eze hụrụ Esta nʼanya karịa ụmụ agbọghọ ndị ọzọ niile. Ọ natara amara na mmasị eze karịa ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị ọzọ. Ya mere, o weere okpueze kpukwasị ya nʼisi mee ya eze nwanyị nʼọnọdụ Vashti.
EST 2:18 Eze kpọrọ oke oriri, nʼihi Esta, nye ndịisi ọchịchị ya niile na ndị ozi ya niile. Ọ kpọsara ezumike nye ndị ọrụ niile nʼalaeze ya, ma kesaakwa onyinye nye ọtụtụ ndị mmadụ dịka eze pụrụ ime.
EST 2:19 Mgbe a chịkọtara ụmụ agbọghọ ndị a na-amaghị nwoke nke ugboro abụọ, Mọdekai nọ ala nʼọnụ ụzọ ama eze.
EST 2:20 Ma Esta emebeghị ka onye ọbụla mara ihe banyere ezinaụlọ ya maọbụ obodo ya, dịka Mọdekai nyere ya nʼiwu, nke ọ na-emeri mgbe a na-azụlite ya.
EST 2:21 Otu ụbọchị, mgbe Mọdekai nọ nʼọrụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọ ukwu eze, ndị onozi abụọ eze nwere, aha ha bụ Bigtan na Teresh, ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọeze nche, were iwe megide eze. Ha gbara izu kpebie na ha ga-egbu eze Sekses.
EST 2:22 Ma Mọdekai chọpụtara nzube ọjọọ a gwa ya Esta, nwunye eze, onye gwara eze, meekwa ka eze mata na ọ bụ Mọdekai gwara ya.
EST 2:23 Mgbe e nyochara kwu a, chọpụta na ọ bụ eziokwu, e jidere mmadụ abụọ ahụ kwụgbuo ha nʼosisi. E dekwara ihe ndị a niile nʼihu eze nʼime akwụkwọ akụkọ ihe e mere.
EST 3:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze bụ Ahasuerọs mere Heman nwa Hamedata onye Agag ka ọ bụrụ onye ukwu, o nyere ya ugwu site nʼinye ya oche dị elu karịa nke ndị ọzọ niile a na-asọpụrụ.
EST 3:2 Ndịisi ọchịchị eze niile na-egbu ikpere nʼala nye Heman nsọpụrụ mgbe ọbụla o si nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze na-agafe, nʼihi na ọ bụ otu a ka eze nyere nʼiwu. Ma Mọdekai ekweghị egbu ikpere nye ya, ọ kwekwaghị enye ya nsọpụrụ.
EST 3:3 Mgbe ahụ, ndị ozi eze ndị nọ nʼọnụ ụzọ ama eze jụrụ Mọdekai ajụjụ si ya, “Gịnị mere i ji na-enupu isi nʼiwu eze nyere?”
EST 3:4 Ha na-agwa ya okwu kwa ụbọchị kwa ụbọchị, ma o geghị ha ntị. Nʼihi nke a, ha gwara Heman ihe banyere ya, ịhụ ma ọ ga-anabata omume Mọdekai, ebe ọ gwara ha na ya bụ onye Juu.
EST 3:5 Ihe a were Heman iwe nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na Mọdekai jụrụ igbu ikpere nʼihu ya, maọbụ ịsọpụrụ ya.
EST 3:6 Mgbe ọ matara ndị Mọdekai ha bụ, ọ dị ya ka ihe ileda anya ma o gbuo naanị Mọdekai. Kama Heman chọrọ ụzọ ọ ga-esi laa ndị Mọdekai niile, bụ ndị Juu nọ nʼalaeze niile nke Sekses nʼiyi.
EST 3:7 Nʼọnwa mbụ, nke bụ ọnwa Nisan, nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị eze Ahasuerọs. Ha fere nza (nke bụ Pua) nʼihu Heman iji họpụta ụbọchị na ọnwa. Ma nza ahụ danyere nʼụbọchị nke iri na atọ nʼọnwa nke iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada.
EST 3:8 Mgbe ahụ Heman sịrị eze Sekses, “O nwere otu ndị gbasara ebe niile, nʼetiti ndị bi nʼobodo dị iche iche niile nke alaeze gị, ha kepụrụ onwe ha iche. Iwu ha dị iche site nʼiwu nke ndị mba ọzọ. Ha adịghị edebekwa iwu eze, ọ gaghị abara eze uru i hapụ ha ka ha nọdụrụ onwe ha.
EST 3:9 Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, ya nye iwu ka a laa ha nʼiyi, aga m akwụnye puku talenti ọlaọcha iri nʼaka ndị nlekọta nʼihi ụlọakụ eze.”
EST 3:10 Ya mere, eze gbapụtara ọlaaka ikike ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Agag, onye iro ndị Juu
EST 3:11 Eze gwara Heman, “Enyela m gị ọlaọcha ahụ, ya na ndị a. Mee ha dịka o si dị gị mma.”
EST 3:12 Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa mbụ, a kpọkọrọ ndị ode akwụkwọ eze niile. Ha depụtara nʼakwụkwọ isi obodo dị iche iche, nakwa nʼasụsụ ndị ọbụla, ihe niile Heman nyere nʼiwu nye ndị nnọchị anya eze niile, ndị ọchịchị nke ala niile ha na-achị, na ndịisi nke ndị ọbụla nọ nʼime alaeze a. E ji aha Ahasuerọs dee akwụkwọ ndị ahụ, werekwa mgbaaka eze nʼonwe ya kaa ya akara.
EST 3:13 E zipụrụ ndị ọgba ọsọ ozi eze ka ha gaa nʼisi obodo ọbụla nʼalaeze ahụ, na-enye iwu a edere nʼakwụkwọ ka a laa nʼiyi, gbuo, ma kpochapụkwa ndị Juu niile, ma nwantakịrị ma okenye, ma nwanyị, ma ụmụntakịrị, nʼotu ụbọchị, nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada, nakwa ịpụnara ha akụnụba ha nʼike.
EST 3:14 Ihe ndepụta nke otu akwụkwọ ahụ bụ nke a ga-enye dịka iwu nʼobodo niile ọbụla site na nkwupụta, mee ka ndị mba niile mara maka ya, nọọkwa na njikere nʼihi ụbọchị ahụ.
EST 3:15 Ọ bụ ndị ozi eze na-agba ọsọ nke ọma ka e nyere ozi ahụ, ka ha jiri ya jee nʼobodo niile. E mekwara ka iwu ahụ baa mmadụ niile bi na Susa ntị. Emesịa, eze na Heman nọdụrụ ala ịṅụ ihe ọṅụṅụ nʼoge ndị niile bi na Susa nọ nʼegwu nʼihi okwu ibibi ndị Juu ahụ.
EST 4:1 Mgbe Mọdekai nụrụ ihe mere, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya, pụọ baa nʼime obodo, na-eti mkpu akwa.
EST 4:2 Ọ bịaruru nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọeze guzo nʼebe ahụ, nʼihi na ọ dịghị onye a na-ekwe ka o yiri akwa mkpe banye nʼogige ụlọeze.
EST 4:3 Nʼalaeze ahụ ndị Juu niile, nọ nʼiru ụjụ na ibu ọnụ na ịkwa akwa na iti aka nʼobi nʼihi iwu eze ahụ. Ọtụtụ yikwa akwa mkpe ha, dinarakwa na ntụ.
EST 4:4 Mgbe ụmụ agbọghọ na ndị onozi Esta gwara ya ihe banyere Mọdekai, o wutere ya nke ukwuu. O zigaara Mọdekai uwe, ka o nwee ike gbanwee uwe mkpe ahụ o yi, ma ọ naraghị ha.
EST 4:5 Mgbe ahụ, Esta ziri ka a kpọọ Hatak, otu nʼime ndị onozi eze, onye nke ọ bụ ọrụ ya ijere Esta ozi, gwa ya ka o jekwuru Mọdekai jụọ ya ihe kpatara nke a, na ihe mere o ji na-eme otu a.
EST 4:6 Hatak jere nʼama obodo ahụ ebe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ụlọeze.
EST 4:7 Mọdekai kọọrọ ya ihe niile, na otu Heman si kwee nkwa ịkwụnye ego nʼụlọakụ eze ka e were laa ndị Juu nʼiyi.
EST 4:8 O nyekwara ya akwụkwọ iwu eze ebe e dere maka ịla ha nʼiyi, bụ nke akpọsara na Susa, ka o gosi ya Esta, kọwaakwa ya nye ya. Ọ gwara ya ka o nye ya iwu ka ọ bakwuru eze rịọ ya arịrịọ amara, rịọkwa ya ebere nʼihi ndị ya.
EST 4:9 Hatak lọghachiri zie Esta ihe niile Mọdekai kwuru.
EST 4:10 Ma Esta gwara Hatak ka o jeghachi gwa Mọdekai sị,
EST 4:11 “Ụwa niile maara nke ọma na onye ọbụla, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị, banyere nʼime ime ụlọeze mgbe eze na-akpọghị ya, ga-anwụ, karịakwa ma eze o setịpụrụ mkpara ọlaedo ya gosi onye ahụ na ọ nabatara ọbịbịa ya. Ugbu a, o meela ihe dị ka otu ọnwa kemgbe eze na-ezibeghị ozi ka a kpọọ m.”
EST 4:12 Mgbe ha gwara Mọdekai ihe Esta zara,
EST 4:13 o zighachiri ọsịsa a, “Echela nʼihi na i bi nʼụlọeze na naanị gị ga-afọdụ ndụ nʼetiti ndị Juu niile.
EST 4:14 Ọ bụrụ na ị gba nkịtị nʼoge a, oghere na napụta ndị Juu ga-esite nʼụzọ ọzọ bịa, ma gị onwe gị na ụlọ nna gị ga-ala nʼiyi. Onye makwanụ ihe mere i ji nọrọ nʼụlọeze nʼoge dị otu a?”
EST 4:15 Mgbe ahụ, Esta zara Mọdekai sị;
EST 4:16 “Gaa kpọkọtaa ndị Juu niile bi na Susa, bukwaaranụ m ọnụ. Unu erila ihe ọbụla, maọbụ ṅụọ ihe ọbụla abalị atọ, ehihie na abalị. Mụ onwe m kwa, na ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi, ga-emekwa otu ihe ahụ. Emesịa, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe megidere iwu, ma aga m aga hụ eze anya. Ihe ọ pụtara ya pụta. Ọ pụtara m ọnwụ, ka m nwụọ!”
EST 4:17 Mọdekai pụrụ, gaa mee dịka Esta gwara ya.
EST 5:1 Nʼabalị nke atọ ya, Esta yiri uwe eze nwanyị ya, guzo nʼime ime ogige ụlọeze, nke chere ihu nʼụlọ nzukọ ukwu dị nʼụlọeze, ebe eze nọdụ nʼocheeze ya chee ihu nʼọnụ ụzọ.
EST 5:2 Mgbe ọ hụrụ Esta bụ nwunye eze ka o na-eguzo nʼogige ahụ, ihe ya masịrị ya, ọ nabatakwara ya site na ị setịpụrụ ya mkpara ọlaedo nke dị nʼaka ya. Ya mere, Esta bịaruru nso metụkwa isi mkpara ọlaedo ahụ aka.
EST 5:3 Eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ, eze nwanyị Esta? Gịnị bụ mkpa gị? Aga m emere gị ya, ọ bụladị ma ọ bụrụ inye gị otu ọkara alaeze m.”
EST 5:4 Esta zara sị, “Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, achọrọ m ka gị na Heman bịa rie oriri m kwadooro unu taa.”
EST 5:5 Eze tụgharịrị gwa ndị ozi ya sị, “Gwanụ Heman ka o mee ngwangwa bịa ka anyị gaa mee ihe Esta rịọrọ.” Emesịa, eze na Heman bịara nʼoriri Esta.
EST 5:6 Mgbe ha na-aṅụ mmanya, eze sịrị Esta, “Ugbu a, gwa m ihe ị chọrọ, aga m enye gị ya, ọ bụladị ma ọ bụrụ otu ọkara alaeze m.”
EST 5:7 Esta zara sị, “Arịrịọ m na mkpa m bụ nke a,
EST 5:8 ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu eze nʼezie, ọ bụrụkwa na ọ masịrị eze imere m ihe m na-arịọ, na ime ihe m na-achọ, ka ya na Heman sorokwa bịa echi nʼoriri ọzọ m ga-akwado. Echi ka m ga-akọkwara gị ihe niile.”
EST 5:9 Heman hapụrụ ebe oriri ahụ nʼoke obi ụtọ. Ma mgbe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ama eze, hụkwa na o bilighị maọbụ maa jijiji nʼihu ya, iwe were ya nke ukwuu.
EST 5:10 Nʼagbanyeghị nke a, Heman jisiri onwe ya ike, laa nʼụlọ ya. Ọ kpọkọtara ndị enyi ya niile na Zeresh, nwunye ya,
EST 5:11 ọ nyara ha isi nʼihi oke akụnụba ya, na ọtụtụ ụmụ ndị ikom ya, nʼụzọ niile nke eze si nye ya nsọpụrụ ma bulikwaa ya elu karịa ndị ọzọ ọkwa ha dị elu na ndị ọrụ eze niile.
EST 5:12 Heman kwukwara sị, “Nke a abụghị dị okwu, ọ bụ naanị mụ ka Esta nwunye eze, kpọrọ ka m soro eze bịa nʼoriri nke ọ kwadooro. Echi ka ọ kpọrọ m ka m soro eze bịa.
EST 5:13 Ma ihe ndị a niile bụ ihe efu mgbe ọbụla m na-ahụ Mọdekai onye Juu ahụ ka ọ na-anọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze.”
EST 5:14 Mgbe ahụ, Zeresh nwunye ya na ndị enyi ya niile, dụrụ ya ọdụ sị ya, “Ihe ị ga-eme bụ nke a: Kwadoo osisi e ji akwụgbu mmadụ, nke ịdị elu ya ga-adị iri mita abụọ na atọ. Nʼụtụtụ echi, rịọ eze ka o nye gị ike ịkwụgbu Mọdekai nʼelu ya. Mgbe e mere nke a, ọṅụ gị ga-ezukwa oke, mgbe ị ga-esorokwa eze gaa rie oriri a kpọrọ unu.” Okwu a masịrị Heman nke ukwuu. O nyere iwu ka a kwadoo osisi ahụ ngwangwa.
EST 6:1 Nʼabalị ahụ, ụra abịaghị eze nʼanya ma ọlị. Nʼihi ya, o metụrụ ya nʼobi ịgụ akwụkwọ ihe ncheta. Ya mere, o nyere iwu ka e wetara ya akwụkwọ a na-edekọta ihe niile e mere nʼoge ọchịchị ya.
EST 6:2 Nʼime ya, ọ gụtara ihe e dere banyere Mọdekai, otu o si kpughee izuzu ọjọọ Bigtan na Teresh, ndị onozi eze na-eche nche nʼọnụ ụzọ ụlọeze, gbara igbu eze Sekses.
EST 6:3 Mgbe ahụ eze jụrụ ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe ọma e meerela Mọdekai nʼihi ihe a o mere?” Ndị ozi ya zara, “O nwebeghị ihe ọbụla e meere ya!”
EST 6:4 Eze sịrị, “Onye nọ nʼogige?” Ma Heman ka batachara na mbata ogige ụlọeze, ịgwa eze banyere mkwugbu Mọdekai nʼelu osisi nke o guzobere nʼihi ya.
EST 6:5 Ndị na-ejere ya ozi zara, “Heman na-eguzo nʼogige.” Eze sịrị, “Kpọbata ya.”
EST 6:6 Mgbe Heman batara, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ugwu m kwesiri inye onye mere ihe na-atọ m ụtọ?” Heman chere nʼime onwe ya sị, “Oleekwanụ onye ọzọ eze ga-achọ inye ugwu karịa mụ onwe m?”
EST 6:7 Ya mere ọ zara eze, “Banyere nwoke ahụ ọ masịrị eze ịkwanyere ugwu,
EST 6:8 nye iwu ka e wepụta uwe gị, nke gị bụ eze yitụrụla, na ịnyịnya gị, nke eze gbaarala, nke e kpukwasịrị oyiyi okpueze nʼisi ya.
EST 6:9 Ka enye uwe ahụ na ịnyịnya ahụ nʼaka otu onye kachasị nwee ugwu nʼime ụmụ eze, ka ha yikwasị nwoke ahụ nke eze chọrọ ịsọpụrụ uwe ahụ, ka ịnyịnya buru ya dịka ha dọkpụ ya na-ejegharị nʼokporoụzọ niile nʼobodo, na-ekwusa nʼihu ya na-asị, ‘Otu a ka a na-emere nwoke ahụ ọ masịrị eze inye nsọpụrụ!’ ”
EST 6:10 Mgbe ahụ eze nyere Heman iwu, sị; “Ahaa! Ntụpụta gị dị mma nke ukwuu! Mee ngwangwa, were uwe ndị a, na ịnyịnya m, meekwara Mọdekai onye Juu ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze ihe niile ndị a i kwuru. Hụkwa na i mechasịrị ihe ndị a niile i kwuru.”
EST 6:11 Ya mere, Heman chịịrị uwe eze ahụ yikwasị ya Mọdekai nʼahụ. O mekwara ka ọ nọdụ nʼelu ịnyịnya eze. Emesịa, o duuru ya jegharịa nʼakụkụ obodo ahụ niile na-eti mkpu na-asị, “Otu a ka eze ga-esi sọpụrụ nwoke ahụ ihe ya dị ya mma.”
EST 6:12 Emesịa, Mọdekai lọghachiri nʼọnụ ụzọ ama eze. Ma Heman mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, kpuchiekwa isi ya nʼiru ụjụ,
EST 6:13 ọ kọọrọ Zeresh nwunye ya, na ndị enyi ya niile ihe niile nke mere ya. Ndị ndụmọdụ ya na nwunye ya Zeresh sịrị ya, “Ebe ọ bụ na Mọdekai, onye ị bidoro ịda nʼihu ya, bụ onye Juu, ị gaghị enwe ike emegide ya, ị ghaghị ịla nʼiyi.”
EST 6:14 Mgbe ha na ya nọ na-akparịta ụka, ndị onozi eze bịaruru duru Heman ngwangwa maka ịga nʼoriri ahụ Esta kwadoro.
EST 7:1 Eze na Heman gara iri oriri ahụ Esta nwunye eze kpọrọ ha,
EST 7:2 mgbe ha nọ na-aṅụ mmanya, nʼụbọchị nke abụọ ahụ, eze jụrụ Esta ajụjụ sị, “Gịnị bụ arịrịọ gị, Esta, eze nwanyị? Gịnị ka ị chọrọ? Ihe ọbụla ọ bụ, aga m enye gị ya, ọ bụladị otu ọkara alaeze m.”
EST 7:3 Nʼikpeazụ, Esta nwunye eze zara sị, “Eze biko, ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, ọ bụrụkwa na ọ masịrị gị, zọpụta ndụ m na ndụ ndị m.
EST 7:4 Nʼihi na mụ na ndị m abụrụla ndị erere ere nʼaka ndị ga-ala anyị nʼiyi. Anyị abụrụla ndị a ga-egbu, na ndị aghaghị ịla nʼiyi. A sị na e rere anyị dịka ndị ohu nwoke na nwanyị, agaara m agba nkịtị, hapụ inye gị nsogbu, ma nʼihi nʼọdịghị ihe ga-akwụ ụgwọ isogbu eze.”
EST 7:5 Eze, bụ Sekses, jụrụ Esta, bụ nwunye eze, “Onye ka mmadụ ahụ bụ, olee ebe ọ nọ, bụ onye na-ezube ime ihe ọjọọ dị otu a?”
EST 7:6 Esta zara, “Ọ bụ onye iro na onye mmegide. Ọ bụ Heman, nwoke ọjọọ a!” Mgbe ahụ, ụjọ dị ukwu jidere Heman nʼihu eze na nwunye eze.
EST 7:7 Eze biliri ọtọ nʼiwe, hapụ mmanya ya site nʼebe oriri ahụ pụọ, gaa nʼime ubi ya a gbara ogige dị nʼụlọeze. Ma Heman nọdụrụ ịrịọ eze nwanyị, bụ Esta arịrịọ maka ndụ ya, nʼihi na ọ maara na eze ekpebiela ịla ndụ ya nʼiyi.
EST 7:8 Mgbe eze sitere nʼubi a gbara ogige lọghachita nʼụlọ oriri ahụ, lee ka Heman tụrụ onwe ya nʼelu oche ahụ Esta na-adabere nʼelu ya. Eze sịrị, “Ọ chọrọ iwedakwa nwunye eze nʼala nʼihu m nʼụlọ m?” Ngwangwa okwu a si nʼọnụ eze pụta, ha kpuchiri Heman akwa nʼihu.
EST 7:9 Mgbe ahụ kwa, Habona otu nʼime ndị ozi eze gwara eze sị, “Onyenwe m, lee na Heman enyela iwu ka a kwadoo osisi nke ịdị elu ya bụ iri mita abụọ na atọ, ebe ọ chọrọrị ịnọ kwụgbuo Mọdekai, nwoke ahụ mere ka a ghara igbu eze. Osisi ahụ guzokwa ugbu a nʼihu ụlọ Heman.” Eze sịrị, “Kwụgbuonụ ya nʼosisi ahụ!”
EST 7:10 Ya mere, ha kwụgburu Heman nʼosisi ahụ ọ kwadoro maka Mọdekai. Iwe eze dajụkwara.
EST 8:1 Nʼotu ụbọchị ahụ, Ahasuerọs bụ eze, nyefere Esta nwunye eze akụnụba niile Heman onye iro ndị Juu nwere. E mekwara ka Mọdekai bịa nʼihu eze, nʼihi na Esta agwala eze na ọ bụ nwanne nna ya.
EST 8:2 Mgbe ahụ, eze wepụtara ọlaaka ikike ya, nke a gbapụtara site nʼaka Heman nye ya Mọdekai. Esta mekwara Mọdekai onye nlekọta akụnụba Heman.
EST 8:3 Ọzọkwa, Esta bịara nʼihu eze daa nʼala nʼụkwụ eze rịọ ya arịrịọ nʼanya mmiri ka ọ kwụsị echiche ọjọọ ahụ Heman onye Agag, chere megide ndị Juu.
EST 8:4 Eze setịpụrụ mkpara ọlaedo ya nye Esta. Esta biliri, guzo nʼihu eze,
EST 8:5 ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na m hụtara amara nʼihu ya, bụrụkwa ihe ziri ezi nʼanya eze, ọ bụrụkwa na ihe m masịrị ya, ka ede iwu nʼakwụkwọ ịkagbu ozi Heman nwa Hamedata, onye Agag, nke o chepụtara dee ime ka a laa ndị Juu nʼiyi nʼala niile eze na-achị.
EST 8:6 Nʼihi na m ga-esi aṅaa nagide ya, ịhụ ka a na-egbu ndị m, na-alakwa ụmụnna m nʼiyi?”
EST 8:7 Mgbe ahụ, eze bụ Ahasuerọs gwara Esta nwunye eze na Mọdekai onye Juu okwu sị ha, “Enyela m Esta akụnụba Heman, ha akwụgbukwaala Heman nʼosisi, nʼihi na ọ chọrọ ịla ndị Juu nʼiyi.
EST 8:8 Ugbu a, deenụ akwụkwọ ozi banyere ndị Juu niile, dee ihe ọbụla dị mma nʼanya unu nʼaha eze. Werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, nʼihi na ọ dịghị akwụkwọ ọbụla e dere nʼaha eze, kaakwa ya akara mgbaaka eze nke a pụrụ imegharị.”
EST 8:9 Otu mgbe ahụ, akpọrọ ndị ode akwụkwọ eze. Ọ bụ nʼiri abalị na atọ nke ọnwa atọ nʼafọ nke bụ ọnwa Sivan ka ihe ndị a mere. Ha dere iwu niile Mọdekai nyere banyere ndị Juu, ndịisi ọchịchị niile na ndị ọchịchị niile na-elekọta mpaghara alaeze niile site nʼIndia ruo Kush. Ọnụọgụgụ ha niile dị otu narị na iri abụọ na asaa (127). E depụtasịrị iwu ahụ nʼodide akwụkwọ nke ala ọbụla a na-achị achị si dị, na dịka asụsụ ndị ọbụla si dị, ma nyekwa ndị Juu dịka odide akwụkwọ na asụsụ ha si dị.
EST 8:10 Mọdekai dere akwụkwọ ahụ nʼaha eze, bụ Ahasuerọs, werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, zipụ akwụkwọ ndị a site nʼaka ndị ọgba ọsọ ndị ịnyịnya na-ebu, bụ ndị na-agba ịnyịnya ụkwụ ọsọ nke e leziri anya nke ọma zụọ maka ije ozi dịrị eze.
EST 8:11 Akwụkwọ nke iwu eze a, nyere ndị Juu niile nọ nʼobodo ọbụla ike izukọta nʼotu maka ịzọ ndụ ha, nyekwa ha ikike ibibi, gbuo ma laa nʼiyi ndị agha nke mba ọbụla, maọbụ ala ndị ahụ a na-achị achị bụ ndị nwere ike ịla ha, ndị inyom ha na ụmụntakịrị ha nʼiyi, na ịpụnara ha akụnụba ha.
EST 8:12 Ụbọchị a akara aka maka ndị Juu ime ihe ndị a nʼobodo niile nʼalaeze eze Ahasuerọs bụ nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada.
EST 8:13 E kwukwara nʼakwụkwọ iwu ahụ na a ghaghị ịnabata iwu eze ahụ nʼobodo ọbụla dị nʼalaeze ya. E kwukwara na a ga-agụpụtara ya mmadụ niile, kọwazie ya ime ka ndị Juu niile nọdụ na njikere imeri ndị iro ha.
EST 8:14 Ndị ahụ na-agba ọsọ, bụ ndị na-ebu akwụkwọ ozi, nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya eze mee ngwangwa pụọ, ebe iwu eze kwaliri ha. E nyekwara iwu a na Susa.
EST 8:15 Mgbe Mọdekai si nʼihu eze pụọ, o yi uwe ndị eze nke na-acha ọcha, na nke na-achakwa anụnụ anụnụ, kpurukwa okpueze ọlaedo dị ukwuu, na uwe mwụda e ji ezi akwa nke na-acha odo odo dụọ nʼahụ ya. Obodo Susa tiri mkpu ṅụrịakwa ọṅụ.
EST 8:16 Nye ndị Juu nʼonwe ha, ọ bụ oge ịṅụrị ọnụ, obi ụtọ na nsọpụrụ.
EST 8:17 Na mpaghara alaeze ahụ niile, na nʼobodo ọbụla nke iwu eze ahụ bịaruru, e nwere ọṅụ na obi ụtọ nʼetiti ndị Juu niile, nweekwa oke oriri na ọṅụṅụ. Ọtụtụ mmadụ nʼime ndị si mba dị iche iche ghọrọ ndị Juu, nʼihi egwu ndị Juu dakwasịrị ha.
EST 9:1 Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Ada, bụ ụbọchị a gaara emezu iwu ahụ eze nyere. Nʼụbọchị a, ndị iro ndị Juu lere anya na ha ga-ekpochapụ ha. Ma ugbu a, a tụgharịala iwu ahụ, mee ya ka ọ bụrụ ihe megidere ndị ahụ kpọrọ ndị Juu asị.
EST 9:2 Ndị Juu chịkọtara onwe ha ọnụ nʼobodo niile dị nʼalaeze eze Sekses, maka ịzọ ndụ ha. Ma o nweghị onye ọbụla pụrụ imegide ha, nʼihi na egwu ha dakwasịrị ndị obodo niile dị iche iche.
EST 9:3 Ndịisi ọchịchị obodo niile, ndị na-anọchite anya eze, na ndịisi, na ndị ozi eze, nyeere ndị Juu aka, nʼihi na ha tụrụ egwu Mọdekai.
EST 9:4 Nʼihi na Mọdekai bụ onye a ma ama nʼụlọeze, ọ bụkwa onye a maara aha ya nʼalaeze ahụ niile, nʼihi na ike ọchịchị ya na-abawanye ụba karịa ụbọchị niile.
EST 9:5 Nke a mere, na ndị Juu ji mma agha gbuo, ma bibie ndị iro ha niile. Ha mesoro ndị kpọrọ ha asị mmeso ọbụla masịrị ha.
EST 9:6 Nʼime obodo ahụ e wusiri ike bụ Susa, ndị Juu gburu narị ndị ikom ise laa ha nʼiyi.
EST 9:7 Ha gbukwara Pashandata, Dalfon, Aspata,
EST 9:8 Porata, Adalia, Aridata,
EST 9:9 Pamashta, Arisai Aridai na Vaizata,
EST 9:10 ha bụkwa ụmụ ndị ikom iri Heman nwa Hamedata, onye iro ndị Juu mụtara. Ma ha emetụghị akụnụba ha aka.
EST 9:11 Nʼụbọchị ahụ, a gwara eze ọnụọgụgụ ndị e gburu nʼobodo Susa.
EST 9:12 Eze sịrị Esta bụ nwunye eze, “Ndị Juu egbuola narị mmadụ ise nʼobodo Susa, gbukwaa ụmụ ndị ikom Heman iri. Ebe ha mere otu a nʼebe a, onye ma ihe ha mere nʼobodo dị iche iche nʼalaeze m? Ugbu a, gịnị ọzọ bụ arịrịọ gị? A ga-emezuru gị ya. Gịnị ọzọ bụ ihe ị chọrọ? A ga-emekwa ya.”
EST 9:13 Esta sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka ndị Juu bi na Susa meekwa ihe ha mere taa echi, ka a kwụbakwa ụmụ ndị ikom iri Heman nʼelu osisi.”
EST 9:14 Ya mere, eze kwenyere, a kụkwara ya dịka ekwe na Susa, a kwụbara ụmụ iri Heman nʼelu osisi.
EST 9:15 Ndị Juu bi na Susa chịkọtakwara onwe ha ọnụ nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa Ada, gbuo narị mmadụ atọ ọzọ nʼobodo Susa. Ma ha emetụghị akụnụba ndị ahụ aka.
EST 9:16 Ma ndị Juu ndị ọzọ bi nʼobodo ndị ọzọ dị iche iche eze na-achị, jikọtakwara onwe ha ọnụ ịzọ ndụ ha, site otu a nwere onwe ha pụọ nʼaka ndị iro ha. Ha gburu iri puku mmadụ asaa na ise bụ ndị kpọrọ ha asị, ma ha emetụghị akụnụba ha aka.
EST 9:17 E mere ihe ndị a nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada, ha zukwara ike nʼụbọchị so ya bụ abalị iri na anọ. Ha mere ụbọchị ahụ, ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ.
EST 9:18 Ma ndị Juu nọ na Susa zukọtara nʼụbọchị nke iri na atọ, na nʼụbọchị nke iri na anọ. Emesịa, nʼụbọchị nke iri na ise ha zuru ike, mekwa ya ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ.
EST 9:19 Ọ bụ nke a mere ndị Juu niile bi nʼime ime obodo ji eme mmemme ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ nʼabalị iri na anọ nke ọnwa iri na abụọ nke afọ ọbụla. Ha mere ụbọchị ahụ ka ọ bụrụkwa ụbọchị inyerịta onyinye.
EST 9:20 Emesịa, Mọdekai dere ihe ndị a niile nʼakwụkwọ, zigakwara ndị Juu niile nọ nʼokpuru ọchịchị eze Sekses, ma ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya,
EST 9:21 ka ha na-eme mmemme a kwa afọ nʼụbọchị nke iri na anọ na nke iri na ise nke ọnwa Ada ọbụla.
EST 9:22 Nke a bụ iji gosi mgbe ndị Juu nweere onwe ha site nʼaka ndị iro ha, na iji cheta mgbe iru ụjụ ha ghọrọ ọṅụ, na mgbe ịkwa akwa ha ghọrọ ụbọchị mmemme ọṅụ. O deere ha ka ha debe ụbọchị ndị a dịka ụbọchị mmemme ọṅụ na oriri na ọṅụṅụ, na inyerịta onwe ha onyinye ihe oriri na inye ụmụ ogbenye onyinye dị iche iche.
EST 9:23 Ya mere, ndị Juu kwenyere ịga nʼihu ime mmemme a nke ha malitere ime, dịka Mọdekai si deere ha ya,
EST 9:24 nʼihi na Heman nwa Hamedata, onye Agag, onye iro ndị Juu niile, kpebiri ịla ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ ọ tụpụtara site nʼife nza.
EST 9:25 Mgbe izu ọjọọ a ruru eze ntị, o nyere iwu nke e debanyere nʼakwụkwọ sị, ka echiche ọjọọ nke Heman megide ndị Juu tụgharịa nʼisi ya, ọ kwukwara ka akwụgbuo ya na ụmụ ndị ikom niile nʼelu osisi.
EST 9:26 Ya mere, a kpọrọ ụbọchị ndị ahụ Purim nke sitere na mkpụrụ okwu Pur. Nʼihi ihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ na nke ha hụkwara na nke mekwaara ha.
EST 9:27 Ndị Juu niile kwekọrịtara idebe mmemme a, na imekwa ka ụmụ ha, na ndị niile kwenyere iso ha, na-emekwa ya. Ha kpebiri na ha ga-edebe ụbọchị abụọ ndị ahụ kwa afọ, nʼụzọ nakwa oge e zubere ka ọ bụrụ.
EST 9:28 Aga na-echeta ụbọchị ndị a, na-eme kwa ya nʼọgbọ niile ọbụla, nʼezinaụlọ ọbụla, nʼala ọbụla a na-achị nakwa obodo ọbụla. Ndị Juu aghaghị idebe mmemme ụbọchị Purim, ma ọ bụkwanụ ncheta ụbọchị ndị a apụọ nʼobi ọgbọ ha niile.
EST 9:29 Nʼoge a, Esta nwunye eze, nwa Abihail, na Mọdekai onye Juu jikọtara aka dee akwụkwọ ọzọ nke e ji mesie akwụkwọ ahụ Mọdekai dere ike, maka ịmalite mmemme Purim.
EST 9:30 Mọdekai zipụrụ akwụkwọ ozi nke okwu udo na eziokwu dị nʼime ya, nye ndị Juu niile bi nʼime mpaghara alaeze Sekses, nke dị otu narị na iri abụọ na asaa (127).
EST 9:31 E ji akwụkwọ a mesie okwu ahụ ike na a ga-edebe ụbọchị ndị ahụ kwa afọ maka mmemme Purim dịka Mọdekai onye Juu na Esta nwunye eze nyere nʼiwu. Ndị Juu niile na ụmụ ụmụ ha ga-eme mmemme a nʼoge a kara aka, dịka ha si edebe iwu ndị ọzọ metụtara oge ibu ọnụ na oge iru ụjụ.
EST 9:32 Iwu a Esta nyere mesịrị ụkpụrụ mmemme Purim ike. E dekwara ya nʼakwụkwọ.
EST 10:1 Eze bụ Ahasuerọs na-anakọta ụtụ site nʼaka ndị niile bi nʼalaeze ya tutu ruo nʼọnụ mmiri osimiri ebe alaeze ahụ sọtụrụ.
EST 10:2 Ma ọrụ ukwu na ọrụ niile ọ rụrụ, ya na ihe niile gbasara ịdị ukwuu nke Mọdekai, na ugwu niile eze nyere ya, ha niile ka e dere nʼime akwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Midia na Peshịa mere nʼoge ọchịchị ha.
EST 10:3 Mọdekai, onye Juu, bụ onye na-esote eze Ahasuerọs nʼọkwa. Ọ bụ onye dị ukwuu nʼetiti ndị Juu, na onye ndị Juu ibe ya na-asọpụkwara, nʼihi na ọ na-elenye anya nʼihe gbasara udo ndị Juu. Ọ bụkwa onye na-ekwuchite ọnụ nʼihe banyere ọdịmma nke ndị Juu niile.
JOB 1:1 Otu nwoke aha ya bụ Job bi nʼobodo Uz. Nwoke a bụ Job bụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla, bụrụkwa onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke ma na-agbara mmehie ọsọ.
JOB 1:2 Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom asaa na ụmụ agbọghọ atọ.
JOB 1:3 O nwere puku atụrụ asaa, na puku ịnyịnya kamel atọ, na ehi ọnụọgụgụ ha dị otu puku e jikọrọ abụọ abụọ, na narị ịnyịnya ibu ise, na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ nwoke dị ukwuu karịa ndị niile bi nʼọwụwa anyanwụ.
JOB 1:4 Ụmụ ya ndị ikom na-eme mmemme oriri na ọṅụṅụ nʼụbọchị ọmụmụ ha nʼụlọ ha, nke ọbụla nʼime ya nʼusoro. Mgbe ha na-eme nke a, ha na-akpọkwa ụmụnne ha ndị nwanyị atọ ka ha bịa soro ha rie ma ṅụkwaa.
JOB 1:5 Mgbe oge mmemme ndị ahụ gwụsịrị, Job na-akpọkọta ụmụ ya doo ha nsọ. Nʼisi ụtụtụ ya, ọ na-achụ aja nsure ọkụ nʼihi onye ọbụla nʼetiti ụmụ ya. Echiche ya bụ, “Ma eleghị anya, ụmụ ya emehiela kọchaa Chineke nʼime obi ha.” Nke a bụ ihe Job na-eme mgbe niile.
JOB 1:6 Otu ụbọchị ụmụ Chineke bịara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị ma ekwensu sonyekwara ha bịa.
JOB 1:7 Onyenwe anyị sịrị Ekwensu, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara Onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.”
JOB 1:8 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ nọ nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla.”
JOB 1:9 Ekwensu zara Onyenwe anyị sị, “Job ọ na-atụ Chineke egwu nʼefu?
JOB 1:10 Ọ bụ na ị gbaghị Job na ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere ogige gburugburu nʼakụkụ niile? I gọziela ọrụ aka ya, nke mere na igwe ewu na atụrụ ya na igwe ehi ya jupụtara ebe niile.
JOB 1:11 Ngwa, setịpụ aka gị metụ ihe niile o nwere aka, ka ị hụ ma ọ gaghị abụ gị ọnụ.”
JOB 1:12 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara ekwensu sị ya, “Lee Job, jiri niile o nwere mee ihe ọbụla ị chọrọ, kama emetụkwala ndụ ya aka.” Emesịa, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ.
JOB 1:13 Otu ụbọchị, mgbe ụmụ Job ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwanyị zukọrọ iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ nʼụlọ nwanne ha nwoke nke okenye.
JOB 1:14 Otu onye nʼime ndị na-eje ozi bịakwutere Job sị, “Mgbe ehi anyị na-akọ ọrụ na mgbe ịnyịnya ibu anyị na-ata nri nʼebe dị nso,
JOB 1:15 ndị Sheba bịara lụsoo anyị ọgụ ma chịkọrọ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ọhụ gị, maọbụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị.”
JOB 1:16 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, onyeozi ọzọ gbabatara kwuo sị, “Ọkụ Chineke zitere sitere na mbara eluigwe daa rechapụ igwe atụrụ na ndị ohu niile. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
JOB 1:17 Mgbe onye nke ahụ nọ na-ekwu okwu, onyeozi ọzọ batara kwuokwa sị, “Ndị agha ndị Kaldịa kere onwe ha ụzọ atọ bịakwasị ịnyịnya kamel gị niile, dọta ha nʼagha, kpụrụ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ohu gị niile gbalaa. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
JOB 1:18 Mgbe ọ kpụ okwu ya nʼọnụ, onyeozi ọzọ batakwara kwuo sị, “Ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nọ nʼụlọ nwanne ha nke okenye na-eri na-aṅụ,
JOB 1:19 na mberede, oke ifufe dị ukwuu nke si nʼọzara feere tie akụkụ anọ nke ụlọ ahụ, mee ka ọ dakwasị ha. Ha niile nwụrụ, ma ọ bụkwa naanị m gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
JOB 1:20 Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala,
JOB 1:21 kwuo sị: “Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa. Onyenwe anyị nyere ihe niile, Onyenwe anyị ewerekwala ihe niile, ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi.”
JOB 1:22 Nʼime ihe ndị a niile, Job emehieghị site nʼibo Chineke ebubo ime ihe ọjọọ.
JOB 2:1 Ụbọchị ọzọkwa, ụmụ Chineke bịakwara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị. Ekwensu sonyekwaara ha ọzọ bịakwa igosi onwe ya nʼihu ya.
JOB 2:2 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụkwara ekwensu ajụjụ sị, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.”
JOB 2:3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ dị nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla. Ọ ka jidekwara izuoke ya, nʼagbanyeghị na ị kpaliri m imegide ya ka m laa ya nʼiyi mgbe ọ na-adịghị ihe o mere.”
JOB 2:4 Ekwensu zaghachiri Onyenwe anyị, “Akpụkpọ anụ ahụ lara akpụkpọ anụ ahụ; mmadụ ga-enye ihe niile o nwere nʼọnọdụ ndụ ya.
JOB 2:5 Setịpụ aka gị metụ akpụkpọ anụ ahụ ya na ọkpụkpụ ya, ọ ghakwaghị ị bụ gị ọnụ nʼihu gị.”
JOB 2:6 Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Lee, ọ nọ nʼaka gị. Kama ị ghaghị idebe ndụ ya.”
JOB 2:7 Mgbe ahụ, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ. O were ọnya ọjọọ na-egbu mgbu tie Job, site nʼọbọ ụkwụ ya ruo nʼopi isi ya.
JOB 2:8 Job tụtụụrụ mpekele ite wara awa, jiri ya na-akọ onwe ya ọkọ nʼahụ, ma dinara nʼebe e kpokọtara ntụ.
JOB 2:9 Nwunye ya sịrị ya, “Ị ka na-eguzo nʼizuoke gị? Bụọ Chineke ọnụ, nwụọ.”
JOB 2:10 Ma ọ zara, “Ị na-ekwu okwu dịka otu nʼime ndị inyom nzuzu. Anyị ga-anata ihe ọma site nʼaka Chineke, hapụ ịnata ihe ọjọọ?” Ma nʼime nsogbu a niile, Job emehieghị site nʼikwu okwu ọjọọ ọbụla.
JOB 2:11 Mgbe ndị enyi Job atọ, Elifaz onye Teman, Bildad onye Shua na Zofa onye Neama, nụrụ banyere nsogbu niile dakwasịrị ya, ha biliri ije site nʼụlọ ha, ha zukọtara site na nkwekọrịta ịga nọnyere ya na ịkasị ya obi.
JOB 2:12 Mgbe ha hụrụ ya site nʼebe dị anya, ha amataghị ya, ha weliri olu bido iti mkpu akwa, dọkaa uwe ha yi nʼahụ ha, kporo aja kpokwasị onwe ha nʼisi.
JOB 2:13 Ha sooro Job nọdụ nʼala ụbọchị asaa, ehihie na abalị. Ọ dịghị onye gwara ya okwu nʼihi na ha hụrụ otu ihe mgbu ya si dị ukwuu.
JOB 3:1 Nʼikpeazụ, onye kwuru okwu bụ Job nʼonwe ya. O kwuru okwu bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ.
JOB 3:2 Job sịrị:
JOB 3:3 “Ka ụbọchị ahụ amụrụ m bụrụ ụbọchị lara nʼiyi; ya na abalị ahụ e kwuru sị, ‘Atụrụ ime nwa nwoke.’
JOB 3:4 Ụbọchị ahụ, ka ọ ghọọ ọchịchịrị: ka Chineke site nʼelu ghara ịjụ ase ya; ka ìhè gharakwa ịmụkwasị ya.
JOB 3:5 Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya, ka igwe ojii kpuchigidekwa ya, ka ọchịchịrị kpuchie ya nʼebe ọ dị ukwuu.
JOB 3:6 Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya, ka a kachapụ ya, ka ọ hapụ ịbụkwa ụbọchị a ga-agụkọ ya na ụbọchị ndị ọzọ nʼafọ, ka ọ ghara dịka otu ụbọchị nke na-adị nʼọnwa.
JOB 3:7 Ka abalị ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị tọgbọrọ nʼefu, ka a ghara ịnụ mkpu ọṅụ ọbụla nʼime ya.
JOB 3:8 Ka ndị ahụ na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ụbọchị ahụ ọnụ, bụ ndị ahụ jikeere ịkpọte Leviatan.
JOB 3:9 Ka kpakpando ụtụtụ ya gbaa ọchịchịrị, ka o lee anya ìhè na-efu, ka ọ ghara ihu mgbubere anya nke chi ọbụbọ,
JOB 3:10 nʼihi na o mechighị akpanwa nne m, i zonarịkwa anya m nsogbu.
JOB 3:11 “Gịnị mere m ji hapụ ịnwụ mgbe ahụ nne m mụpụtara m, kubie ume mgbe m si nʼime akpanwa pụta?
JOB 3:12 Gịnị mere ikpere ji dịrị ịnabata m? Gịnị mere ara ji dịrị i ji zụọ m?
JOB 3:13 Nʼihi na ugbu a, agara m idina nʼudo; agaara m anọ nʼụra na izuike,
JOB 3:14 mụ na ndị eze na ndị ọchịchị nke ụwa, ndị rụkwaara onwe ha ebe obibi dị iche iche nke tọgbọọrọ nʼefu ugbu a,
JOB 3:15 mụ na ụmụ ndị ikom eze, ndị nwere ọlaedo, ndị jikwa ọlaọcha kpojuo ụlọ ha.
JOB 3:16 Ọ bụ gịnị mere e zofughị m nʼala dịka nwantakịrị a mụkworo amụkwo, dịka nwa ọhụrụ nke na-ahụghị ìhè nke ụbọchị anya?
JOB 3:17 Nʼebe ahụ ka ndị na-emebi iwu na-akwụsị iweta ọgbaaghara, nʼebe ahụ ka ndị ike gwụrụ na-ezu ike.
JOB 3:18 Ebe ahụ ka ndị nọ nʼagbụ na-enwere onwe ha, ha adịghị anụkwa ịba mba nke ndị na-eji aka ike achị ha.
JOB 3:19 Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ; ebe ahụ kwa ka ohu na-enwere onwe ya kpamkpam site nʼaka onye nwe ya.
JOB 3:20 “Nʼihi gịnị ka e ji enye ndị nọ nʼọnọdụ nhụju anya ìhè? Gịnị bụ uru ndụ nye onye mkpụrụobi ya jupụtara nʼihe ilu?
JOB 3:21 Gịnị bụ uru ya nye ndị na-echere ọnwụ ma ọ dịghị abịa, ee, ndị na-achọsi ọnwụ ike karịa akụ e zoro ezo,
JOB 3:22 ndị jupụtara nʼọṅụ, na-aṅụrị ọṅụ mgbe ha rịdaruru nʼili?
JOB 3:23 Gịnị mere e ji enye mmadụ ndụ; bụ onye ahụ ụzọ ya zoro ezo, onye Chineke mechibidoro ụzọ?
JOB 3:24 Nʼihi na ịma ọsụ aghọọla ihe oriri m kwa ụbọchị; ịsụ ude m na-awụpụtakwa dịka mmiri.
JOB 3:25 Ihe m tụrụ egwu ya abịakwasịla m, ihe m tụrụ ụjọ ya bụ ihe bịakwasịrị m.
JOB 3:26 Enweghị m udo, anọkwaghị m jụụ, enweghị m izuike, naanị ọgbaaghara.”
JOB 4:1 Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:
JOB 4:2 “Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu? Onye kwanụ nwere ike ịnọ nʼebe a hapụ ikwu okwu?
JOB 4:3 Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ, na ka i si mee ka ndị na-ada mba nwee ume.
JOB 4:4 Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ, ị bụrụla ịgbaume nye ndị ikpere ha na-ama jijiji.
JOB 4:5 Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba; nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji.
JOB 4:6 Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị, izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị?
JOB 4:7 “Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi? Ebee ka i hụrụ ka e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi?
JOB 4:8 Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka na-aghọta ya dịka ihe ubi.
JOB 4:9 Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta. Ọ na-esitekwa nʼoke iwe ya repịa ha.
JOB 4:10 Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ, ma eze ọdụm dị ike ka a gbajisiri.
JOB 4:11 Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara, ụmụ nne ọdụm niile ka a na-achụsa.
JOB 4:12 “E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo, ntị m nụrụ ya nʼịgba izu.
JOB 4:13 Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị, mgbe oke ụra na-adakwasị ụmụ mmadụ,
JOB 4:14 oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m, meekwa ka ọkpụkpụ niile dị nʼahụ m maa jijiji.
JOB 4:15 Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee. Ọ bụladị ajị dị m nʼahụ guzochara ọtọ nʼihi ụjọ.
JOB 4:16 Ọ kwụsịrị; ma apụghị m ịkọ ihe ọ bụ. Onyinyo guzooro nʼanya m, anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị:
JOB 4:17 ‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke? Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya?
JOB 4:18 Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi, ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe,
JOB 4:19 ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa, bụ ndị ntọala ha dị nʼaja, ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.
JOB 4:20 Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha: ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, ihe niile a na-agakwa dịka o si aga.
JOB 4:21 Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu, mee ka ha nwụọ na-enweghị amamihe?’
JOB 5:1 “Kpọọ oku ma ị chọọ, ma onyekwanụ ga-aza gị? Ole ndị dị nsọ ị ga-agbakwuru?
JOB 5:2 Oke iwe na-egbu onye nzuzu, ekworo na-egbu onye na-enweghị uche.
JOB 5:3 Mụ onwe m ahụla onye nzuzu ka ọ na-agba mgbọrọgwụ, mana mberede, abụrụ ụlọ ya ọnụ.
JOB 5:4 Ụmụ ya na-anọpụ anya site nʼebe nchebe dị, a na-azọpịa ha nʼọnụ ụzọ ama, ọ dịkwaghị onye na-anapụta ha.
JOB 5:5 Onye agụụ na-agụ na-eripịa ihe o wetara nʼubi; ọ na-ewere ihe ubi ndị a ọ bụladị site nʼetiti ogwu; akụnụba ya ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ga-achụso.
JOB 5:6 Nʼihi na ọnọdụ ọjọọ adịghị esite nʼala pupụta, ma ọ bụkwanụ nsogbu adịghịkwa esite nʼala walite.
JOB 5:7 Kama, a mụrụ mmadụ nye nsogbu, dịka ire ọkụ si esite nʼọkụ a kwanyere na-amali elu.
JOB 5:8 “Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke; ya ka m ga-akọsara ihe niile.
JOB 5:9 Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta, ọrụ ebube nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.
JOB 5:10 Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo, ma na-ezigakwa mmiri nʼubi niile.
JOB 5:11 Ọ na-ebuli ndị dị ala elu, na-emekwa ka ndị na-eru ụjụ nọ nʼebe a na-echebe ha.
JOB 5:12 Ọ na-emebi nzube niile nke ndị aghụghọ, ka aka ha ghara imezu ihe ha zubere.
JOB 5:13 Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile, mee ka atụmatụ ndị aghụghọ bụrụ ihe e kpochapụrụ.
JOB 5:14 Ọchịchịrị na-abịakwasị ha nʼoge ehihie, nʼetiti ehihie ha na-asọ ìsì dịka ndị nọ nʼọchịchịrị nke abalị;
JOB 5:15 Ọ na-azọpụta ndị mkpa na-akpa, site na mma agha dị ha nʼọnụ, ọ na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị dị ike.
JOB 5:16 Ya mere, ndị ogbenye na-enwe olileanya, ikpe ezighị ezi na-emechikwa ọnụ ya.
JOB 5:17 “Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ Chineke na-adọ aka na ntị; ya mere, ajụla ịdọ aka na ntị nke Onye pụrụ ime ihe niile.
JOB 5:18 Nʼihi na ọ na-etihịa mmadụ ahụ ma na-ekechikwa ọnya ha; Ọ na-eti mmadụ ihe, ma aka ya na-agwọkwa.
JOB 5:19 Ọ ga-anapụta gị site nʼụzọ nsogbu isii, mee ka ihe ọjọọ hapụ irute gị na nsogbu nke asaa.
JOB 5:20 Ọ ga-echebe gị ka ị hapụ ịnwụ nʼoge ụnwụ; chebekwa gị ka mma agha hapụ ịmetụ gị nʼoge agha.
JOB 5:21 Ị ga-abụ onye a na-echebe site na nkwutọ nke ire ndị ga-ekwutọ gị. Ị gaghị atụkwa egwu mgbe mbibi bịara.
JOB 5:22 Ị ga-achị ọchị nʼoge ụnwụ na nʼoge mbibi, ị gaghị atụkwa egwu ajọ anụ ọhịa dị iche iche.
JOB 5:23 Nʼihi na gị na nkume niile dị nʼọhịa ga-agba ndụ, gị na anụ ọhịa ga-anọkwa nʼudo.
JOB 5:24 Ị ga-amata na ụlọ ikwu gị dị nʼudo; ị ga-agụkọ ihe niile i nwere chọpụta na o nweghị nke na-efu efu.
JOB 5:25 Ị ga-amata na ụmụ gị ga-adị ọtụtụ, matakwa na ụmụ ụmụ gị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka ahịhịa dị nʼala.
JOB 5:26 Ị ga-aba nʼili gị mgbe i mere nnọọ ezigbo agadi, dịka ọka a ghọrọ mgbe oge ya ruru.
JOB 5:27 “Anyị enyochaala ihe a, hụ na ọ bụ eziokwu. Ya mere nụrụ ya, ma jiri ya rụọ ọrụ na ndụ gị.”
JOB 6:1 Mgbe ahụ, Job zara sị:
JOB 6:2 “A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m ya na nhụju anya m niile nʼelu nʼihe ọtụtụ!
JOB 6:3 Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri, nke mere okwu m ji ada ike ike.
JOB 6:4 Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m; mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha; ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m.
JOB 6:5 Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata, ka oke ehi ọ na-akwa akwa mgbe ihe oriri ya dị?
JOB 6:6 A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu, ka o nwere ụtọ dị na eso ọkwụrụ?
JOB 6:7 A jụrụ m ịmetụ ya aka, nʼihi na nri dị otu a na-eme ka m daa ọrịa.
JOB 6:8 “O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ, na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya.
JOB 6:9 Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m.
JOB 6:10 Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a, wụlikwaa elu nʼime ihe mgbu na-adịgide, na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ.
JOB 6:11 “Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ? Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi?
JOB 6:12 Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume? Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz?
JOB 6:13 Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka, ugbu a, e siterela nʼebe m nọ wezuga nzube?
JOB 6:14 “Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.
JOB 6:15 Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha, dịka iyi mmiri na-akọ, dịka iyi nke na-etofe ọnụ ya,
JOB 6:16 nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi, nke unyi jupụtara nʼihi mgbaze nke mkpụrụ mmiri oyi.
JOB 6:17 Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị, nke na-ata ata nʼihi okpomọkụ.
JOB 6:18 Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha. Ha na-arịgo nʼala akọrọ si otu a laa nʼiyi.
JOB 6:19 Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri, otu a kwa ndị ahịa Sheba na-ele anya nʼolileanya.
JOB 6:20 Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi, ha bịarutere ebe ahụ, bụrụ ndị emenyere ihere.
JOB 6:21 Ma ugbu a, unu egosila na unu abaghị uru, unu ahụla ihe na-eyi egwu ma ụjọ ejidela unu.
JOB 6:22 O nweela mgbe m sịrị unu, ‘Nyenụ ihe ọbụla nʼọnọdụ m, sitenụ nʼakụnụba unu kwụọ ụgwọ ịgbapụta m,
JOB 6:23 gbapụtanụ m nʼaka ndị iro, maọbụ napụtanụ m nʼaka ndị na-enweghị obi ebere’?
JOB 6:24 “Zienụ m ihe ga-eme ka m mechie ọnụ, gosi m ebe m si mejọọ.
JOB 6:25 Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi! Ma gịnị ka ịrụ ụka unu na-ewepụta?
JOB 6:26 Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m? Si otu a mee ka okwu onye ike gwụrụ ghọọ ikuku efu?
JOB 6:27 Unu nwere ike ife nza nʼisi onye na-enweghị nna, ma refukwaa enyi unu.
JOB 6:28 “Lezie m anya nke ọma, ọ dị unu ka m nwere ike ilegide unu anya gwa unu okwu ụgha?
JOB 6:29 Kwụsịnụ ihe unu na-eme. Unu abụla ndị na-eme ihe na-ezighị ezi, tuleenụ ihe unu na-eme, nʼihi na ezi omume m ka guzosiri ike.
JOB 6:30 Ọ dị ihe ọjọọ si nʼegbugbere ọnụ m abụọ pụta? Ọ bụ na ọnụ m apụghị ịchọpụta nzube iro?
JOB 7:1 “Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba? Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ?
JOB 7:2 Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada, maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya,
JOB 7:3 otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya, nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya.
JOB 7:4 Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’ Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ.
JOB 7:5 Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ; anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.
JOB 7:6 “Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa, ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla.
JOB 7:7 O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume; anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ.
JOB 7:8 Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ; unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ.
JOB 7:9 Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa, otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa.
JOB 7:10 E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ; ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ.
JOB 7:11 “Ya mere agaghị m emechi ọnụ; aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ. Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi.
JOB 7:12 A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri, nke mere i ji eche m nche?
JOB 7:13 Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi, maọbụ na oche izuike m ga-ewepụ ntamu m,
JOB 7:14 nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwu werekwa ịhụ ọhụ mee ka m maa jijiji,
JOB 7:15 ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ, karịa inwe ụdị ahụ m nke a.
JOB 7:16 Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi. Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi.
JOB 7:17 “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe, i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya,
JOB 7:18 i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile, ma na-anwale ya mgbe mgbe?
JOB 7:19 Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ, maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri?
JOB 7:20 Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị, gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme? Gịnị mere i ji elekwasị m anya? Abụrụla m ibu arọ nye gị?
JOB 7:21 Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m, ma bupụ mmehie m? Nʼihi na oge ọnwụ m eruola nso, e, oge a ga-eliba m nʼaja, ma m nwụọ. Mgbe ahụ ị ga-achọ m, ma ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ, nʼihi na agaghị m adịkwa.”
JOB 8:1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zaghachiri sị:
JOB 8:2 “Ruo ole mgbe ka i ga na-ekwu okwu dị otu a? Okwu ọnụ gị bụ naanị ifufe dị ike.
JOB 8:3 Chineke ọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Onye pụrụ ime ihe niile ọ na-eme ka ihe ziri ezi gbagọọ agbagọ?
JOB 8:4 Mgbe ụmụ gị mehiere megide ya, o weere ha nyefee nʼikpe ọmụma kwesiri mmehie ha.
JOB 8:5 Ma ọ bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike, rịọ Onye pụrụ ime ihe niile,
JOB 8:6 ọ bụrụ na ị bụ onye dị ọcha nʼobi na onye ụzọ ya ziri ezi, ọ bụladị ugbu a, ọ ga-agbachitere gị weghachi gị nʼọnọdụ ịbụ ọgaranya gị.
JOB 8:7 Ọ bụ ezie, na mmalite gị nwere ike ịdị ala, ma ụbọchị ikpeazụ gị ga-adị elu.
JOB 8:8 “Jụọ ọgbọ ndị gara aga ma chọpụta ihe ndị bụ nna ha chọpụtara.
JOB 8:9 Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ndị a mụrụ naanị ụnyaahụ, ndị ọ dịghị ihe ha maara. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dịka onyinyo.
JOB 8:10 Ọ bụ na ha agaghị agwa gị ma kuziekwara gị ihe? Ọ bụ na ha agaghị esite na nghọta kwuo okwu?
JOB 8:11 Ahịhịa papịrọs o nwere ike ito nʼebe apịtị na-adịghị? Ahịhịa riidi ọ ga-eto nʼebe mmiri na-adịghị?
JOB 8:12 Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha, ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ.
JOB 8:13 Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke, otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi.
JOB 8:14 Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa; ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide.
JOB 8:15 Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi; ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa.
JOB 8:16 Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị, nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ.
JOB 8:17 Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ, ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a.
JOB 8:18 Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya, ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’
JOB 8:19 Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ, site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa.
JOB 8:20 “Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ, maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume.
JOB 8:21 Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị. Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta.
JOB 8:22 Ndị iro gị ka a ga-eyikwasị ihere dị ka uwe, ebe obibi nke ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa.”
JOB 9:1 Job zara sị:
JOB 9:2 “Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu. Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke?
JOB 9:3 Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ, ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya?
JOB 9:4 Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara, onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ?
JOB 9:5 Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a, na-akwatụ ha nʼiwe ya.
JOB 9:6 Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya, mee ka ogidi ya maa jijiji.
JOB 9:7 Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha; ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye.
JOB 9:8 Naanị ya gbasara mbara eluigwe, ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri.
JOB 9:9 Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe.
JOB 9:10 Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta, ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta.
JOB 9:11 Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya, mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya.
JOB 9:12 Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya? Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’
JOB 9:13 Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi, ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya.
JOB 9:14 “Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ, maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka?
JOB 9:15 Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu; kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere.
JOB 9:16 A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m, ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị.
JOB 9:17 Ọ ga-eji oke ifufe tirie m, meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya.
JOB 9:18 Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m.
JOB 9:19 Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu! Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya.
JOB 9:20 A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe; ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara.
JOB 9:21 “Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị ejighị m onwe m kpọrọ ihe; nʼezie ana m eleda ndụ m anya.
JOB 9:22 Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị, ‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’
JOB 9:23 Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede, ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị.
JOB 9:24 Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu, ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya?
JOB 9:25 “Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ; ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya.
JOB 9:26 Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs, dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri.
JOB 9:27 Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m, aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’
JOB 9:28 Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha.
JOB 9:29 Ebe m bụrịị onye ikpe mara, nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu?
JOB 9:30 A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m werekwa soda saa aka m abụọ,
JOB 9:31 ị ga-enuba m nʼolulu apịtị nke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị.
JOB 9:32 “Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya, ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe.
JOB 9:33 A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị, onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya,
JOB 9:34 onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ, ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ.
JOB 9:35 Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu; ma ka ọ dị ugbu a ọ dịghị ihe m nwere ike ime.
JOB 10:1 “Ike ịdị ndụ agwụla m. Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi, kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị.
JOB 10:2 Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe, kama gwa m ihe mere i ji ama m ikpe.
JOB 10:3 Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m, si otu a leda ọrụ aka gị anya, mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu?
JOB 10:4 Ị nwere anya nke anụ ahụ? Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ si ahụ?
JOB 10:5 Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ, ka afọ nke gị, ha dịka nke mmadụ dị ike?
JOB 10:6 Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma m ma nyochaa mmehie m?
JOB 10:7 Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m, na ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m site nʼaka gị.
JOB 10:8 “Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m. Ọ ga-atụgharịa ugbu a bibie m?
JOB 10:9 Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ. Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ọzọ?
JOB 10:10 Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehi mee ka m kpụkọta dịka mmiri ara rahụrụ arahụ?
JOB 10:11 Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ, werekwa ọkpụkpụ na akwara kpaa m dịka uwe?
JOB 10:12 I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị, nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m.
JOB 10:13 “Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị, amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche.
JOB 10:14 Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya, ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m.
JOB 10:15 Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m! A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu nʼihi na ejupụtara m nʼihere, bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m.
JOB 10:16 Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ ma werekwa ike gị dị egwu megide m.
JOB 10:17 I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m, mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ; ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri.
JOB 10:18 “Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m? Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m.
JOB 10:19 A sịkwarị na amụpụtaghị m maọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili!
JOB 10:20 Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole? Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị ka m nwetu ọṅụ nwa mgbe nta,
JOB 10:21 tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ ebe m na-agaghị esi pụtakwa.
JOB 10:22 Nʼala nke oke ọchịchịrị, ala nke onyinyo ọnwụ, nke usoro na-adịghị, ebe ọbụladị ìhè dịkwa ka ọchịchịrị.”
JOB 11:1 Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:
JOB 11:2 “Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a? A ga-agụ onye ekwurekwu a dịka onye ikpe na-amaghị?
JOB 11:3 Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị? Ọ bụ na ọ dịghị onye ga-abara gị mba mgbe ị na-akwa emo?
JOB 11:4 Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ, adịkwa m ọcha nʼanya gị.’
JOB 11:5 Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu, na ọ ga-asaghe egbugbere ọnụ ya imegide gị.
JOB 11:6 Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe, nʼihi na ezi amamihe nwere akụkụ abụọ. Mara nke a: Chineke echefuola ụfọdụ mmehie gị.
JOB 11:7 “I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke? I nwere ike ịnwapụta nsọtụ nke Onye pụrụ ime ihe niile?
JOB 11:8 Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime? Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma?
JOB 11:9 Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa, dị obosara karịa oke osimiri.
JOB 11:10 “Ọ bụrụ na ọ bịa tụba gị nʼime ụlọ mkpọrọ, kpọkọta ndị ikpe, onye ga-egbochi ya?
JOB 11:11 Nʼezie, ya onwe ya na-amata ndị nduhie, mgbe ọ hụrụ ajọ ihe, ọ bụ na ọ dịghị amatakwa ya?
JOB 11:12 Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe naanị mgbe nwa ịnyịnya ibu ọhịa mụrụ ghọrọ mmadụ.
JOB 11:13 “Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya, setịpụ aka gị abụọ nye ya,
JOB 11:14 ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka, ghara ikwe ka ihe ọjọọ dịrị nʼụlọ ikwu gị
JOB 11:15 mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị, ị ga-eguzokwa chịm na-atụghị egwu.
JOB 11:16 Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị, na-echeta ya dịka mmiri gabigara agabiga.
JOB 11:17 Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie, ọchịchịrị ya ga-adịkwa ka ụtụtụ.
JOB 11:18 Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị; ị ga-elegharịkwa anya gburugburu gị zuo ike na-atụghị ụjọ.
JOB 11:19 Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla, ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ịnata amara nʼihu gị.
JOB 11:20 Ma anya ndị na-emebi iwu ga-ada, ha agaghị achọta ụzọ mgbapụ; olileanya ha ga-abụ nkubi ume nke ọnwụ.”
JOB 12:1 Mgbe ahụ, Job zara:
JOB 12:2 “Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe, unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu.
JOB 12:3 Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu; abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ. Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu?
JOB 12:4 “Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ, nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za, onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị!
JOB 12:5 Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.
JOB 12:6 Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ; ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo, bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.
JOB 12:7 “Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị, maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị.
JOB 12:8 Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị, maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị.
JOB 12:9 Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a?
JOB 12:10 Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị, ya na ndụ ụmụ mmadụ
JOB 12:11 Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu, otu ire si anwale ihe oriri?
JOB 12:12 Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye? Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?
JOB 12:13 “Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike, ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.
JOB 12:14 Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ; mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ.
JOB 12:15 Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa. Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile.
JOB 12:16 Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị; ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.
JOB 12:17 Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha, ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu.
JOB 12:18 Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere, ma were akwa mgbochi kee ha nʼukwu.
JOB 12:19 Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha, kwatuokwa ndị ọnọdụ ha sirila ike ogologo oge gara aga.
JOB 12:20 Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi, wepụkwa nghọta nke ndị okenye.
JOB 12:21 Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị, napụkwa ngwa agha nke ndị dị ike.
JOB 12:22 Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị meekwa ka oke ọchịchịrị pụta ìhè.
JOB 12:23 Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi; Ọ na-eme ka mba baa ụba, ma chụsakwaa ha.
JOB 12:24 Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha, zipụkwa ha ka ha na-awagharị nʼọzara ebe ụzọ na-adịghị.
JOB 12:25 Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè. Ọ na-eme ha ka ha na-adagharị dịka ndị mmanya na-egbu.
JOB 13:1 “Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile, ntị m anụla ma ghọtakwa ha.
JOB 13:2 Mụ onwe m makwa ihe unu maara; abụghị m onye dị ala nʼebe unu nọ.
JOB 13:3 Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu, ka mụ na Chineke rụọkwa ụka banyere okwu m.
JOB 13:4 Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ; unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru.
JOB 13:5 Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị, nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe.
JOB 13:6 Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m; geekwanụ ntị nụrụ okwu si m nʼọnụ na-apụta.
JOB 13:7 Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide? Unu ga-esite nʼokwu aghụghọ kwuchitere Chineke ọnụ ya?
JOB 13:8 Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe? Unu ga-ekwuchite ọnụ Chineke?
JOB 13:9 Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu? Unu pụrụ ịghọgbu ya dịka unu si aghọgbu ndị mmadụ?
JOB 13:10 Ọ ghaghị ịbara unu mba ma ọ bụrụ na unu ejiri okwu ụgha chọọ inyere ya aka.
JOB 13:11 Ọ ga-abụ na ebube na ịdị ukwuu ya adịghị eme ka unu maa jijiji? Egwu ya ọ dịghị atụ unu?
JOB 13:12 Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ; okwu ngọpụ unu dịka ihe ngọpụ ụrọ.
JOB 13:13 “Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu; ihe ọ pụtara ya pụta.
JOB 13:14 Nʼihi gịnị ka m ga-eji tinye onwe m na nsogbu, werekwa ndụ m tinye nʼọbụaka m?
JOB 13:15 A sịkwarị na ọ ga-etigbu m aghaghị m ịtụkwasị ya obi m. Aga m ekwuchite ọnụ m gwa ya na ụzọ m dị ọcha.
JOB 13:16 Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụta maka na ọ dịghị onye ajọ omume ọbụla pụrụ ịbịa nʼihu ya.
JOB 13:17 Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m. Kwerenụ ka ihe m na-ekwu baa unu ntị.
JOB 13:18 Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro, amatala m na ikpe agaghị ama m.
JOB 13:19 Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo? Ọ bụrụ na o nwere, aga m emechi ọnụ m ma nwụọ.
JOB 13:20 “Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke, mgbe ahụ agaghị m ezo onwe m nʼihu gị.
JOB 13:21 Wepụ aka gị i ji emegide m, meekwa ka ha dị anya nʼebe m nọ. Kwụsị ime ka oke egwu gị mee ka m maa jijiji.
JOB 13:22 Mgbe ahụ, kpọọ m oku, aga m azakwa gị. Maọbụ, kwerekwa ka m kwuo okwu, ka ị zaa m.
JOB 13:23 Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere? Gosi m ajọ omume m na mmehie m.
JOB 13:24 Gịnị mere i ji gbakụta m azụ? Gịnị mere i ji gụọ m dịka onye iro gị?
JOB 13:25 Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ? Ị ga-achụ ahịhịa kpọrọ nkụ ọsọ?
JOB 13:26 Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m, na-emekwa ka m ghọrọ mkpụrụ mmehie m mere nʼoge okorobịa m.
JOB 13:27 Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ; na-enyochakwa nzọ ụkwụ m niile site nʼitinye akara nʼebe ọbụla ọbụ ụkwụ m zọrọ.
JOB 13:28 “Ya mere, mmadụ nʼala nʼiyi dịka ihe rere ere, na dịka akwa nke nla riri.
JOB 14:1 “Mmadụ nke nwanyị mụrụ nwere ụbọchị ole na ole nke jupụtara na nsogbu.
JOB 14:2 Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya, dịka onyinyo, ọ na-agabiga agabiga.
JOB 14:3 Ị na-elegide onye dị otu a anya? Ị ga-akpọ ya ikpe nʼihu gị?
JOB 14:4 Onye pụrụ iwepụta ihe dị ọcha site nʼihe na-adịghị ọcha? Ọ dịghị onye ọ bụ.
JOB 14:5 Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ; ị kabiela ọnụọgụgụ nke ọnwa ya niile, kpaakwa oke ebe ọ na-agaghị agabiga.
JOB 14:6 Nʼihi nke a, wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya ruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu dịka onye e goro ọrụ.
JOB 14:7 “Ma olileanya dịịrị osisi; nʼihi na ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epuchikwa, alaka ọhụrụ ya aghaghị ịwapụtakwa.
JOB 14:8 A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala, maọbụ na ogwe ya anwụọ nʼaja,
JOB 14:9 mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya, ọ na-epupụta dịka ihe a kụrụ akụ.
JOB 14:10 Ma mmadụ na-anwụ, e lie ya; ọ na-ekubikwa ume si otu a gabiga.
JOB 14:11 Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata, maọbụ ka mmiri dị nʼiyi si ata nʼoge ọkọchị,
JOB 14:12 otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ; tutu ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa; mmadụ ọbụla apụghị i si nʼụra kpọtee ya, agaghị akpọtekwa ha site nʼụra ha.
JOB 14:13 “A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ, na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara. A sị na ị ga-akanyere m oge ma mesịa cheta m.
JOB 14:14 Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ? Ụbọchị niile nke ọrụ ahụhụ m, aga m echere mgbe nnapụta m ga-abịa.
JOB 14:15 Ị ga-akpọ, aga m azakwa gị, agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị.
JOB 14:16 Nʼihi mgbe ahụ ị ga-agụ nzọ ụkwụ m niile ọnụ, ma ị gaghị agụkọ mmehie m.
JOB 14:17 A ga-ekechi njehie m nʼakpa, ị ga-ekpuchi mmehie m.
JOB 14:18 “Ma dịka ugwu si erichasi daa, na dịka a na-enupu oke nkume nʼọnọdụ ya,
JOB 14:19 dịka mmiri si akwọchasị nkume, na dịka oke mmiri ozuzo si akwazekwa aja ala, otu a ka i si eme ka olileanya mmadụ laa nʼiyi.
JOB 14:20 Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga; ị na-eme ka ihu ya gbanwee, ma zilaga ya.
JOB 14:21 Ọ bụrụ na a na-asọpụrụ ụmụ ha, ha adịghị amata nke a; ọ bụrụkwa na a na-eweda ha nʼala, ha ọ dịghị ahụ ya.
JOB 14:22 Ihe mgbu nke anụ ahụ ya ka ọ na-ama ma na-erukwara naanị onwe ya ụjụ.”
JOB 15:1 Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:
JOB 15:2 “Onye maara ihe ọ ga-eji okwu na-abaghị uru zaghachi? Ọ ga-emeju afọ ya nʼifufe na-ekpo ọkụ nke si nʼọwụwa anyanwụ?
JOB 15:3 Ọ ga-eji okwu na-abaghị uru rụọ ụka, maọbụ kwuo okwu na-enweghị isi?
JOB 15:4 Ma ị na-eleda ezi omume anya na-egbochikwa ịsọpụrụ Chineke.
JOB 15:5 Mmehie gị na-eme ka ọnụ gị kwuo okwu ngwangwa; ọ bụkwa ire ndị aghụghọ ka i nwere.
JOB 15:6 Ọnụ gị na-ama gị ikpe, ọ bụghị mụ onwe m, egbugbere ọnụ gị na-ekwu okwu megide gị.
JOB 15:7 “Ị bụ mmadụ mbụ a mụrụ? A mụọla gị tupu e kee ugwu niile?
JOB 15:8 Ọ getụla ntị nʼizu nzuzo nke Chineke? Amamihe niile ọ bụ nʼime gị ka ha juru?
JOB 15:9 Gịnị ka ị maara nke anyị na-amaghị? Ụdị nghọta dị aṅaa ka i nwere nke anyị na-enweghị?
JOB 15:10 Ndịisi awọ na ndị kara nka nọ nʼetiti anyị, ndị ikom mere agadi karịa nna mụrụ gị.
JOB 15:11 Ọ ga-abụ na nkasiobi Chineke bụrụ gị ihe nta, ka ọ bụ okwu dị nro nke ọ gwara gị?
JOB 15:12 Gịnị mere obi gị ji duhie gị, gịnị mekwara anya gị abụọ ji chagharịa,
JOB 15:13 nke mere iwe gị jiri dị ọkụ megide Chineke, meekwa ka okwu ọjọọ ndị a niile si nʼọnụ gị pụta?
JOB 15:14 “Gịnị ka mmadụ efu bụ, ọ ga-eji dị ọcha nʼobi, gịnị ka mmadụ nwanyị mụrụ bụ, na ha nwere ike ị bụ ndị ezi omume?
JOB 15:15 Ọ bụrụ na Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi, ọ bụrụkwa na eluigwe adịghị ọcha nʼanya ya,
JOB 15:16 ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi, bụ onye na-aṅụ ajọ omume dịka mmiri.
JOB 15:17 “Gee m ntị ka m kọwaara gị; kwerekwa ka m gwa gị ihe m hụrụ,
JOB 15:18 bụ ihe ndị amamihe kwuru, ndị na-ezobeghị ihe ha natara nʼaka nna nna ha,
JOB 15:19 bụ ndị e nyefere ala ndị a nʼaka ha mgbe ọ dịghị onye ọbịa gabigara nʼetiti ha.
JOB 15:20 Ụbọchị ndụ ya niile, onye ajọ omume na-ata ahụhụ mmekpa ahụ, bụ nke e debere ogologo afọ nye nwoke ahụ na-eme ihe ike.
JOB 15:21 Ụzụ na-eweta oke egwu na-eju ya ntị, mgbe ọ dị ka ihe niile na-aga nke ọma, ndị na-apụnara mmadụ ihe na-abịakwasị ya.
JOB 15:22 O nweghị olileanya ịgbanarị ọchịchịrị; mma agha nọ na-echere ya.
JOB 15:23 Ọ na-akpagharị na-achọ ebe nri dịka udele; ọ makwara na ụbọchị ọchịchịrị nọ nso.
JOB 15:24 Ahụhụ na mkpagbu na-eme ka ọ tụọ oke egwu, nsogbu na-abịakwasị ya dịka eze nke nọ na njikere ibuso ndị iro ya agha.
JOB 15:25 Nʼihi na ọ na-atụ Chineke aka nʼihu, dokwaa onwe ya imegide Onye pụrụ ime ihe niile.
JOB 15:26 O ji ikwesi olu ike, dịka ọta siri ike, na-emegide Chineke.
JOB 15:27 “Ọ bụ ezie na abụba kpuchiri ihu ya, abụba nke dị nʼukwu ya na-eme ka anụ ahụ nupụtakwa,
JOB 15:28 ọ ga-ebi nʼobodo e bibiri ebibi, nʼụlọ nke mmadụ na-ekwesighị ibi nʼime ha, ụlọ nke na-adakasị adakasị.
JOB 15:29 Ma ọ gaghị aga nʼihu ị bụ ọgaranya, akụ ya agaghị adịgidekwa. Ihe o nwere agakwaghị agbasapụ nʼala niile ahụ.
JOB 15:30 Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị, ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ, iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya.
JOB 15:31 Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu, nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta.
JOB 15:32 Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju, ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ
JOB 15:33 Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha, dịka osisi oliv nke akwụkwọ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
JOB 15:34 Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke ga-adị ka nwanyị aga, ọkụ ga-erepịa ụlọ ikwu niile nke ndị hụrụ iri ngarị nʼanya.
JOB 15:35 Ha na-atụrụ ihe ọjọọ dịka ime, ma mụọkwa ajọọ omume; naanị aghụghọ ka akpanwa ha na-arụpụta.”
JOB 16:1 Mgbe ahụ, Job zara sị:
JOB 16:2 “Anụla m ọtụtụ ihe dịka ndị a; ndị nkasiobi na-eweta ọnọdụ ọjọọ ka unu niile bụ.
JOB 16:3 Ogologo okwu efu ndị a niile unu na-ekwu, ọ naghị akwụsị? Gịnị bụ nsogbu unu nke mere unu ji aga nʼihu na-arụ ụka niile ndị a?
JOB 16:4 Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu, ma ọ bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m; enwere m ike kwuo okwu dị ụtọ na ntị megide unu, ma fufekwaa isi m megide unu.
JOB 16:5 Ma ọnụ m ga-agba unu ume; nkasiobi si nʼegbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ.
JOB 16:6 “Ma ọ bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m, ọ bụrụ na m ahapụ ikwu okwu, ọdịghị esi nʼahụ m pụọ?
JOB 16:7 Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m, i tidakwala ezinaụlọ m.
JOB 16:8 I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m; ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m.
JOB 16:9 Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m, ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m; onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya.
JOB 16:10 Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị, ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo, jikọtakwa onwe ha megide m.
JOB 16:11 Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume, tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu.
JOB 16:12 Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m. O jidere m nʼolu ma tiwasịa m. O meela m ihe ịgba ụta ya;
JOB 16:13 ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu. Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko mee ka oluilu m wụsịa nʼala.
JOB 16:14 Mgbe niile, ọ na-emegide m; ọ na-achụso m dịka dike nʼagha.
JOB 16:15 “Adụkọtala m akwa mkpe were ya kpuchie anụ ahụ m, liekwa ikuanya m nʼime ntụ.
JOB 16:16 Ihu m na-acha ọbara ọbara site nʼakwa nke m na-akwa, onyinyo nke ọnwụ dịkwa gburugburu egbugbere anya m abụọ;
JOB 16:17 ma aka m emeghị ihe ike ọbụla, ọzọ ekpere m dịkwa ọcha.
JOB 16:18 “Ala, biko, ezokwala ọbara m; mee ka akwa m ghara ịbụ ihe lara nʼiyi!
JOB 16:19 Ọ bụladị ugbu a, onye akaebe m nọ nʼeluigwe, onye nkwuchite ọnụ m nọ nʼebe dị elu.
JOB 16:20 Onye na-arịọrọ m arịrịọ bụ enyi m, dịka m na-awụsara Chineke anya mmiri m.
JOB 16:21 Nʼọnọdụ mmadụ ka ọ na-arịọ Chineke dịka mmadụ na-arịọ nʼihi enyi ya.
JOB 16:22 “Naanị afọ ole na ole ga-agabiga tupu m ga nʼụzọ nke nlọghachi m na-adịghị.
JOB 17:1 Mmụọ m tiwara etiwa, ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ, ili na-echere ịnabata m.
JOB 17:2 Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu; anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha.
JOB 17:3 “Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ. Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe?
JOB 17:4 I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta; ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri.
JOB 17:5 Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya, anya ụmụ ya ga-ada mba.
JOB 17:6 “Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla, meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu.
JOB 17:7 Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ; ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ.
JOB 17:8 Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a; ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume.
JOB 17:9 Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha, ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike.
JOB 17:10 “Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ! Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu.
JOB 17:11 Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi. Ma ọchịchọ nke obi m
JOB 17:12 na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie; nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso.
JOB 17:13 Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili, ọ bụrụ na m agbasaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị,
JOB 17:14 a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’ maọbụ sị ikpuru ‘Nne m’ maọbụ ‘Nwanne m nwanyị,’
JOB 17:15 ebeekwa ka olileanya m dị? Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya?
JOB 17:16 Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ? Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?”
JOB 18:1 Mgbe ahụ Bildad onye Shua zara sị:
JOB 18:2 “Ruo ole mgbe ka ị ga-ekwubi okwu ndị a ị na-ekwu? Nwee ezi uche ka anyị kparịtaa ụka.
JOB 18:3 Gịnị mere i ji were anyị dịka anụ ọhịa, gụọ anyị dịka ndị na-enweghị uche nʼanya gị?
JOB 18:4 Gị onye na-eji iwe adọkasị onwe gị, a ga-ahapụ ụwa nʼihi gị? Ka a ga-enupu oke nkume nʼọnọdụ ha?
JOB 18:5 “A na-afụnyụ oriọna nke onye na-emebi iwu; ire ọkụ ya ga-akwụsịkwa inwu enwu,
JOB 18:6 ìhè nke dị nʼime ụlọ ikwu ya na-abụ ọchịchịrị, oriọna nke dị nʼakụkụ ya na-anyụkwa.
JOB 18:7 Ike agakwaghị adị na nzọ ukwu ya; atụmatụ ya onwe ya ga-atụda ya nʼala.
JOB 18:8 Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya; ọ na-akpagharị na-adaba nʼime oghere.
JOB 18:9 Ọnya na-ejide ikiri ụkwụ ya, ọnya ahụ na-ejidesi ya ike.
JOB 18:10 E zobere ya ụdọ ọnya igbudu nʼala, ihe e ji ejide ya na-echere ya nʼụzọ ya.
JOB 18:11 Ihe egwu na-emenye ya ụjọ nʼakụkụ niile, na-agbasokwa nzọ ụkwụ ya niile.
JOB 18:12 Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike; mbibi nọkwa na njikere na-eche mgbe ọ ga-ada.
JOB 18:13 Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya; ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile.
JOB 18:14 Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile.
JOB 18:15 Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya; a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya.
JOB 18:16 Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala, alaka ya ga-akpọnwụ nʼelu.
JOB 18:17 A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ, o nweghị onye ọbụla na-echetakwa aha ya.
JOB 18:18 A na-esite nʼìhè chụba ya nʼọchịchịrị, otu a kwa, a na-achụpụkwa ya site nʼụwa.
JOB 18:19 O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya, ọ dịghị onye fọdụrụ nʼebe o bi na mbụ.
JOB 18:20 Ọnọdụ ya na-eju ndị si nʼọdịda anyanwụ anya; oke egwu na-ejidekwa ndị si nʼọwụwa anyanwụ nʼihi ya.
JOB 18:21 Nʼezie, otu a ka ebe obibi nke onye ajọ omume dị, ee, bụ onye ahụ nke na-amaghị Chineke.”
JOB 19:1 Job zara sị:
JOB 19:2 “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ata m ahụhụ? Ruo ole mgbe ka unu ga-ewere okwu ọnụ unu zọpịa m?
JOB 19:3 Ugboro iri ndị a ka unu kọcharala m, ihere adịghị eme unu na unu na-ebuso m agha?
JOB 19:4 A sịkwarị na m bụ onye mmehie, ọ bụ naanị mụ onwe m ka ọ gbasara.
JOB 19:5 Ọ bụrụ na unu na-ebuli onwe unu elu karịa m, ma were ọnọdụ ịdị ala m megide m,
JOB 19:6 mgbe ahụ, maranụ na Chineke emejọọla m, were ụgbụ ya tụọ m gburugburu.
JOB 19:7 “Ọ bụ ezie na m na-eti mkpu akwa sị: ‘A na-emejọ m.’ Ma ọ dịghị ọsịsa m na-anata; ọ bụ ezie na m na-eti mkpu ka e nyere m aka ma ikpe ziri ezi adịghị.
JOB 19:8 Ọ nọchiela ụzọ m ka m ghara ịgafe; o jirila ọchịchịrị kpuchie ụzọ m.
JOB 19:9 O yipụla m ugwu m, wepụkwa okpueze m kpu nʼisi.
JOB 19:10 Ọ na-eti m ihe otiti nʼakụkụ niile, ruo mgbe m gabigara; ọ na-ehopu olileanya m dịka osisi.
JOB 19:11 Iwe ya dị ọkụ megide m; ọ na-agụnyekwa m dịka onye iro ya.
JOB 19:12 Ndị agha ya ji ike na-abịa; ha ewuola mgbidi were nnọchibido m ha agbaala ụlọ ikwu m gburugburu imegide m.
JOB 19:13 “O meela ka ụmụnne m na ndị enyi m si nʼebe m nọ pụọ.
JOB 19:14 Ndị ikwu m anaghị etinyekwa uche nʼihe banyere m; ndị ezi enyi m niile echefuola m.
JOB 19:15 Ndị ọbịa nọ nʼụlọ m na ndị odibo m nwanyị na-agụ m dịka onye ala ọzọ; adị m ka onye mba ọzọ nʼebe ha nọ.
JOB 19:16 Ana m akpọ odibo m oku ma ọ dịghị aza m, ọ bụladị mgbe m jiri ọnụ m rịọ ya.
JOB 19:17 Iku ume m abụrụla ihe nwunye m apụghị ịnagide; abụrụla m ihe arụ nye ụmụnne m.
JOB 19:18 Ọ bụladị ụmụntakịrị nwoke na-akwa m emo; ha na-ejikwa m eme ihe ọchị mgbe ọbụla m pụtara.
JOB 19:19 Ndị ahụ m kpọrọ ndị enyi ọma m na-ele m anya dịka m bụ ihe arụ; ndị ahụ niile m hụrụ nʼanya echigharịakwala megide m
JOB 19:20 Abụ m naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ; ihe m ji gbanarị ọnwụ adịghị ukwuu.
JOB 19:21 “Meerenụ m ebere, ndị enyi m, meerenụ m ebere, nʼihi na aka Chineke na-emegide m.
JOB 19:22 Gịnị mere unu ji achụ m dịka Chineke si achụ m? Ọ ga-abụ na ahụhụ m ejubeghị unu afọ?
JOB 19:23 “Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na e dekọrọ okwu m nʼakwụkwọ,
JOB 19:24 na e ji mkpisi igwe dee ha, maọbụ kakwasị ha nʼelu mbadamba nkume ruo mgbe ebighị ebi.
JOB 19:25 Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ, amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ.
JOB 19:26 Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m, ma nʼanụ ahụ m aga m ahụ Chineke.
JOB 19:27 Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị onye ọzọ. Lee ka obi m si anụ ọkụ nʼime m maka nke a!
JOB 19:28 “Ọ bụrụ na unu asị, ‘Anyị ga-emegide ya nʼihi na nsogbu a si nʼaka ya,’
JOB 19:29 unu onwe unu kwesiri ịtụ egwu mma agha; nʼihi na iwe ga-ebute ịta ahụhụ nke mma agha, mgbe ahụ, unu ga-ama na ikpe dị.”
JOB 20:1 Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:
JOB 20:2 “Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi nʼihi na anọ m na mwute dị ukwuu.
JOB 20:3 Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m, ma nghọta m na-akpalịte m ịzaghachi gị.
JOB 20:4 “Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie, ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa.
JOB 20:5 Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta, ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge.
JOB 20:6 Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe, na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii;
JOB 20:7 ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ; ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’
JOB 20:8 Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla, dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu.
JOB 20:9 Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ, ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ.
JOB 20:10 Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye; aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya.
JOB 20:11 Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ.
JOB 20:12 “Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ, na ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya;
JOB 20:13 ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya, ọ na-edebe ya nʼọnụ ya,
JOB 20:14 ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya, ọ ga-aghọkwa elo agwọ nʼime afọ ya.
JOB 20:15 Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara; Chineke ga-eme ka o si nʼafọ ya gbọpụtachaa ha.
JOB 20:16 Ọ ga-amịcha elo agwọ, eze agwọ ajụala ga-egbu ya.
JOB 20:17 Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi, bụ iyi nke na-asọ asọ nke jupụtara na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.
JOB 20:18 Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu. Uru ọ zụtara nʼahịa agaghị abụrụ ya ihe ọṅụ.
JOB 20:19 Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla, ọ nakọtakwara ụlọ nke ọ na-ewughị.
JOB 20:20 “Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya; ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya.
JOB 20:21 Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa, ọganihu ya agaghị adịgide.
JOB 20:22 Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya, oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya.
JOB 20:23 Mgbe o rijuru afọ ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya, iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo.
JOB 20:24 Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga, àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ.
JOB 20:25 Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya, site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma. Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya.
JOB 20:26 Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya, ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya.
JOB 20:27 Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya ụwa niile ga-ebili megide ya.
JOB 20:28 Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya; oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke.
JOB 20:29 Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu, ya bụkwa ihe nketa nke Chineke kwadooro ha.”
JOB 21:1 Mgbe ahụ, Job zara sị:
JOB 21:2 “Gee ntị nke ọma nʼokwu m; ka nke a bụrụ nkasiobi ị ga-enye m.
JOB 21:3 Nwee ndidi ka m kwuchaa okwu m, mgbe m kwuchara, gaa nʼihu ịkwa m emo.
JOB 21:4 “Ọ bụ mmadụ ka m na-ekpesara? Gịnị ka m ga-eji ghara ịbụ onye na-enweghị ndidi?
JOB 21:5 Lee m anya ka ahụ maa gị jijiji; were aka gị kpuchie ọnụ gị.
JOB 21:6 Mgbe m chere echiche maka nke a, egwu tụrụ m meekwa ka ahụ m maa jijiji.
JOB 21:7 Gịnị mere ndị ajọ omume ji enwe ndụ ogologo, ghọọ okenye, baakwa ụba nʼịdị ike?
JOB 21:8 Ha na-ahụ ụmụ ka ha na-akwụsike ike gburugburu ha, ụmụ ha ka ha ji anya ha ahụ.
JOB 21:9 Ha na-ebi ndụ udo nʼezinaụlọ ha na-atụghị egwu na ihe ọjọọ ọbụla ga-adakwasị ha; mkpara Chineke adịghịkwa adakwasị ha.
JOB 21:10 Oke ehi ha na-agba nne ehi ha na-esepụghị aka; nne ehi ha na-amụ ụmụ, ha adịghị ekwo ime.
JOB 21:11 Ha na-ezipụ ụmụ ha dịka igwe atụrụ; ụmụntakịrị ha na-etegharị egwu.
JOB 21:12 Ha na-abụ abụ nʼụda egwu otiti na ụbọ akwara; ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼụda nke ọja.
JOB 21:13 Ha na-anọ ụbọchị ndụ ha niile nʼọganihu, ha na-arịdakwa nʼili ha nʼudo.
JOB 21:14 Ma ndị a na-asị Chineke, ‘Hapụ anyị aka, ọ dịghị anyị mkpa ịmata ụzọ gị.
JOB 21:15 Onye ka Onye pụrụ ime ihe niile bụ, anyị ga-eji jeere ya ozi? Uru gịnị ka ịrịọ ya arịrịọ ga-abara anyị?’
JOB 21:16 Ma ọganihu ha adịghị nʼaka ha ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.
JOB 21:17 “Ma ugboro ole ka a na-emenyụ ọkụ oriọna nke ndị na-emebi iwu? Ugboro ole ka nhụju anya na-adakwasị ha, bụ nke Chineke kenyere ha nʼiwe ya?
JOB 21:18 Ugboro ole ka ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ nʼihu ikuku, maọbụ dịka igbugbo ọka nke ikuku siri ike na-efesasị?
JOB 21:19 A na-asị, ‘Chineke na-akpakọtara ụmụ ha ntaramahụhụ nke njehie ha.’ Ka a kwụghachi ha ya, ka ha nwee ike mata ya.
JOB 21:20 Ka anya ha hụ mbibi nke onwe ya, ka ha ṅụọ ọnụma nke Onye pụrụ ime ihe niile dịka mmiri.
JOB 21:21 Gịnị gbasara ha banyere ezinaụlọ ha hapụrụ mgbe ọnwa ndị e kenyere ya bịara na ngwụcha?
JOB 21:22 “Ọ dị onye pụrụ izi Chineke ihe ọmụma, ebe ọ bụ ya na-ekpe ndị kachasị elu ikpe?
JOB 21:23 Otu onye na-anwụ mgbe o jupụtara nʼike na ume, mgbe ọ nọ na nchekwa na udo,
JOB 21:24 mgbe ahụ ya bụ nke eji ezi nri zụọ nke ọma, ọkpụkpụ ya jupụtakwara nʼụmị.
JOB 21:25 Onye ọzọ na-anwụ nʼihe ilu nke mkpụrụobi, nʼihi na o nweghị mgbe o riri ezi ihe ọbụla.
JOB 21:26 Nke ọbụla nʼime ha dina nʼakụkụ ibe ya nʼime aja, ikpuru kpuchikwara ha abụọ.
JOB 21:27 “Amaara m nke ọma ihe bụ echiche unu na nzube unu ji emegide m.
JOB 21:28 Unu ga-ajụ m ajụjụ sị, ‘Ugbu a, ole ụlọ oke mmadụ ahụ. Ụlọ ikwu ndị ahụ ebe ndị na-emebi iwu biiri?’
JOB 21:29 Ọ bụ na unu ajụbeghị ndị njem ajụjụ? Ọ bụ na unu ejighị ihe ha kọrọ mere ihe,
JOB 21:30 na a na-echebe ndị ọjọọ pụọ nʼụbọchị nhụju anya, na a na-anapụta ha site nʼụbọchị oke iwe?
JOB 21:31 Onye na-atụ ha mmehie ha nʼihu? Onye kwa na-akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere?
JOB 21:32 A na-eburu ha gaa nʼili, a na-echekwa ili ha nche.
JOB 21:33 Aja dị na ndagwurugwu na-atọ ha ụtọ; Mmadụ niile na-eso ha nʼazụ, na ọtụtụ a na-apụghị ịgụta ọnụ na-ebu ha ụzọ nʼaga.
JOB 21:34 “Ya mere, olee otu unu ga-esi were okwu na-enweghị isi kasịe m obi? Ọ dịghị ihe fọdụrụ nʼọsịịsa unu ma ọ bụghị naanị okwu ụgha.”
JOB 22:1 Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:
JOB 22:2 “Mmadụ ọ pụrụ ịbara Chineke uru? Ọ bụladị onye nwere uche ọ pụrụ ịbara Chineke uru?
JOB 22:3 O nwere ọṅụ ọ ga-enye Onye pụrụ ime ihe niile ma a sị na ị bụ onye ezi omume? Uru gịnị ka ọ ga-enweta ma ọ bụrụ na ụzọ gị niile enweghị ịta ụta?
JOB 22:4 “Chineke ọ na-abara gị mba na-ebo gị ebubo nʼihi na ị na-atụ egwu ya?
JOB 22:5 Ọ bụ na mmebi iwu gị adịghị ukwuu? Mmehie gị o nwere ọgwụgwụ?
JOB 22:6 Ị naara ụmụnne gị ihe ebe nʼefu; ị yipụrụ ndị mmadụ uwe ha gbawa ha ọtọ.
JOB 22:7 I nyeghị ndị ike gwuru mmiri, i nyeghịkwa ndị agụụ na-agụ ihe oriri.
JOB 22:8 Ọ bụ eziokwu na ị bụ nwoke dị ike na onye nwere ala, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ bi nʼala ya,
JOB 22:9 Ị na-agbaba ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, zipụ ha, Ị na-anyaji ogwe aka nke ụmụ na-enweghị nna.
JOB 22:10 Ọ bụ ya mere ọnya jiri gbaa gị gburugburu, bụrụkwa ihe mbibi ji eyi gị egwu.
JOB 22:11 Ọ bụkwa ya mere ọchịchịrị ji gbaa gị gburugburu ka ị ghara ịhụ ụzọ, meekwa ka idee mmiri kpuchie gị.
JOB 22:12 “Ọ bụ na Chineke anọghị nʼebe dị elu nke eluigwe? Lee ka ịdị elu nke kpakpando dị elu si dị.
JOB 22:13 Kama ị na-asị, ‘Gịnị ka Chineke maara? Ọ na-esite nʼoke ọchịchịrị dị otu a ekpe ikpe?
JOB 22:14 Oke ọchịchịrị kpuchiri ya, nke mere na ọ naghị ahụ anyị mgbe ọ na-agagharị nʼebe dị elu nke eluigwe.’
JOB 22:15 Ị ga-agbaso ụzọ ochie nke ndị na-eme ihe ọjọọ zoro ije na ya?
JOB 22:16 E bupụrụ ha tupu oge ha eruo. Ntọala ndụ ha ka idee mmiri sachapụrụ
JOB 22:17 Ha sịrị Chineke, ‘Hapụ anyị aka! Gịnị ka Onye pụrụ ime ihe niile ga-eme anyị?’
JOB 22:18 Ma ọ bụ ya ji ihe dị mma dị iche iche mejupụta ụlọ ha, ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.
JOB 22:19 Ndị ezi omume na-ahụ mbibi ndị dị otu a ma ṅụrịa; ndị aka ha dị ọcha na-akwa ha emo sị:
JOB 22:20 ‘Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị, ọkụ erepịala akụnụba ha.’
JOB 22:21 “Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo, nʼụzọ dị otu a, ọganihu ga-abịara gị.
JOB 22:22 Gee ntị, nabata ndụmọdụ si ya nʼọnụ, doo okwu ya niile nʼobi gị.
JOB 22:23 Ọ bụrụ na ịlaghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, ọ ga-eweghachi gị nʼọnọdụ gị; ọ bụrụ na iwezuga ihe mmebi iwu mee ka ọ dị anya site nʼebe ụlọ ikwu gị dị,
JOB 22:24 tọgbọ ọkpụrụkpụ ọlaedo gị nʼaja, tụpụkwa ọlaedo nke Ọfịa gị nʼelu nkume dị nʼime ọdọ mmiri nta.
JOB 22:25 Mgbe ahụ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-abụrụ gị ọlaedo, bụkwara gị ọlaọcha kachasị mma.
JOB 22:26 Nʼezie, mgbe ahụ kwa, ihe nke Onye pụrụ ime ihe niile ga-atọ mkpụrụobi gị ụtọ, ị ga-ewelikwa ihu gị nye Chineke.
JOB 22:27 Ị ga-ekpe ekpere, ọ ga-azakwa gị ekpere gị, ị ga-emezukwa nkwa i kwere.
JOB 22:28 Ihe i kpebiri ga-emezukwa, ìhè ga-amụkwasị nʼụzọ gị niile.
JOB 22:29 Mgbe a na-eweda ndị mmadụ ala, ọ bụrụkwa na ị sị, ‘Bulienụ ha elu,’ mgbe ahụ ọ ga-azọpụta ndị e wedara nʼala.
JOB 22:30 Ọ ga-azọpụta ọ bụladị onye ahụ nke aka ya na-adịghị ọcha, bụ onye nke a ga-azọpụta site nʼịdị ọcha nke aka gị.”
JOB 23:1 Mgbe ahụ, Job zara sị:
JOB 23:2 “Ọ bụladị taa, mkpesa m dị ilu; aka ya dị arọ megide m nʼagbanyeghị ịsụ ude m.
JOB 23:3 A sịkwa na m maara ebe m ga-achọta ya; a sịkwa na m nwere ike ijeru ebe obibi ya!
JOB 23:4 Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu ya were ịrụ ụka mejuo ọnụ m.
JOB 23:5 Aga m achọpụta ihe o ga-aza m ma tuleekwa ihe ọ ga-agwa m.
JOB 23:6 Ọ ga-eji ike dị egwu megide m? Mba, ọ gaghị ebo m ebubo.
JOB 23:7 Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya. Nʼebe ahụ, a ga-anapụtakwa m site nʼaka onye ikpe m rụọ mgbe ebighị ebi.
JOB 23:8 “Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ; ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, agaghị m achọta ya.
JOB 23:9 Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya, mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya.
JOB 23:10 Ma ọ maara ụzọ m na-aga, mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo,
JOB 23:11 ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya; ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe.
JOB 23:12 Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m; a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị.
JOB 23:13 “Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya? Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya.
JOB 23:14 Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m, ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m.
JOB 23:15 Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya; mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya.
JOB 23:16 Chineke emeela ka obi m daa mba; Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka m maa jijiji.
JOB 23:17 Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m, bụ oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.
JOB 24:1 “Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe? Gịnị mere ndị maara ya ga-eji na-ele anya nʼefu maka oge ndị a?
JOB 24:2 Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala, na-elekọta igwe atụrụ ha zutere nʼohi.
JOB 24:3 Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei, ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe.
JOB 24:4 Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa. Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha.
JOB 24:5 Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara, otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri, ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri.
JOB 24:6 Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi, na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume.
JOB 24:7 Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị, ha enwekwaghị akwa iji kpuchie onwe ha oyi.
JOB 24:8 Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ, ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba.
JOB 24:9 Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara. Nwa ọhụrụ nke onye ogbenye ka a na-anara nʼihe ebe.
JOB 24:10 Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị, ha na-ebu ukwu ọka ma nọrọ nʼagụụ.
JOB 24:11 Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya, ha na-azọchapụta mmanya vaịnị ma akpịrị na-akpọ ha nkụ.
JOB 24:12 Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili, mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka. Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a.
JOB 24:13 “Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè, ndị na-amaghị ụzọ ya maọbụ na-anọgide nʼụzọ ya.
JOB 24:14 Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili, gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa; nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi.
JOB 24:15 Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji; ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’ ọ na-ekpuchikwa ihu ya.
JOB 24:16 Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa, ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ; o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ.
JOB 24:17 Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha, ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi.
JOB 24:18 “Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri; ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ, nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha.
JOB 24:19 Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee, otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike.
JOB 24:20 Akpanwa na-echefu ha, ikpuru na-eji ha mere ihe oriri; anaghị echetakwa ndị ajọọ omume kama a na-etiji ha dịka osisi.
JOB 24:21 Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa, ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ.
JOB 24:22 Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ, ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ.
JOB 24:23 Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha, ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile.
JOB 24:24 A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị, a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ, a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka.
JOB 24:25 “Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụgha si otu a mee ka okwu m bụrụ ihe efu?”
JOB 25:1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị:
JOB 25:2 “Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke; Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe.
JOB 25:3 Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ? Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị?
JOB 25:4 Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke? Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha?
JOB 25:5 Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta, ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya,
JOB 25:6 ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru, mmadụ, nke bụ naanị idide.”
JOB 26:1 Mgbe ahụ, Job zaghachiri:
JOB 26:2 “Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka! Leekwa ka i si zọpụta ogwe aka nke onye ume na-adịghị!
JOB 26:3 Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe! Leekwa ụdị oke nghọta nke ị gosipụtara.
JOB 26:4 Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a? Mmụọ onye si nʼọnụ gị kwuo okwu?
JOB 26:5 “Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu, ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya.
JOB 26:6 Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke; mbibi tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya.
JOB 26:7 Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu. O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya.
JOB 26:8 Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii, ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa.
JOB 26:9 Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya, na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya,
JOB 26:10 O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri, ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.
JOB 26:11 Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji, tụọkwa oke egwu nʼihi ịba mba ya.
JOB 26:12 Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri; ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab.
JOB 26:13 Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma; aka ya dupuru agwọ na-agba ọsọ.
JOB 26:14 Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya; lee ka o si dị nta bụ okwu ntakwu anyị na-anụ gbasara ya! Onye pụrụ ịghọtacha ịda ụda nke ike ya?”
JOB 27:1 Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
JOB 27:2 “Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi, Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi.
JOB 27:3 Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m, mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m,
JOB 27:4 egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ, ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ.
JOB 27:5 Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi; ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m.
JOB 27:6 Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya; o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m.
JOB 27:7 “Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume, ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu.
JOB 27:8 Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya, mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya?
JOB 27:9 Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya mgbe nsogbu dakwasịrị ya?
JOB 27:10 Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile? Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile?
JOB 27:11 “Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke; agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile.
JOB 27:12 Unu onwe unu ahụla ihe ndị a, gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi?
JOB 27:13 “Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume, nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
JOB 27:14 Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha; ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha.
JOB 27:15 Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ; ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha.
JOB 27:16 Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu, ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ,
JOB 27:17 ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha, ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya.
JOB 27:18 Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla, dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru.
JOB 27:19 Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ; mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola.
JOB 27:20 Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri; oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị.
JOB 27:21 Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ; ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya.
JOB 27:22 Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere mgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya.
JOB 27:23 Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo, were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya.”
JOB 28:1 Olulu e si egwupụta ọlaọcha dị; ebe a na-anụcha ọlaedo dịkwa.
JOB 28:2 E si nʼime ala ewepụta igwe, ọlanchara na-agbazepụta site nkume na-aghọ ọla.
JOB 28:3 Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ; ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya, na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị.
JOB 28:4 Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi, nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru, nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.
JOB 28:5 Ala ahụ e si na ya enweta nri, abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya.
JOB 28:6 Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya; aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo.
JOB 28:7 Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo; anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya.
JOB 28:8 Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya, ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.
JOB 28:9 Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.
JOB 28:10 Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ, anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.
JOB 28:11 Ha na-achọpụta isi mmiri niile ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè.
JOB 28:12 Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe? Olee kwa ebe nghọta bi?
JOB 28:13 Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya, agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.
JOB 28:14 Ogbu mmiri na-asị, “Ọ dịghị nʼime m,” osimiri na-asị, “Ọ dịghị nʼaka m.”
JOB 28:15 A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya, apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.
JOB 28:16 A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya, a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,
JOB 28:17 A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya, maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.
JOB 28:18 Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị; ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.
JOB 28:19 A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya; a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.
JOB 28:20 Olee ebe amamihe si abịa? Olee ebe nghọta bi?
JOB 28:21 E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ, e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe.
JOB 28:22 Mbibi na ọnwụ na-asị; “Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị.”
JOB 28:23 Chineke ghọtara ụzọ ya, naanị ya makwara ebe obibi ya dị.
JOB 28:24 Nʼihi na ọ na-ahụ nsọtụ nke ụwa, na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe.
JOB 28:25 Mgbe o hiwere ike nke ikuku, tụọkwa mmiri nʼihe ọtụtụ,
JOB 28:26 mgbe o nyere mmiri ozuzo iwu meekwa ụzọ nye egbe eluigwe na oke ikuku,
JOB 28:27 mgbe ahụ, o lere amamihe anya, nyochasịa ya, meekwa ka o guzosie ike, ma nwapụtakwa ya.
JOB 28:28 Ọ sịrị mmadụ, “Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe; ọzọ, ị sị nʼihe ọjọọ wezuga onwe bụ nghọta.”
JOB 29:1 Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
JOB 29:2 “Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga, dịka ụbọchị ndị ahụ mgbe Chineke na-elekọta m,
JOB 29:3 mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi ìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị.
JOB 29:4 Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma, mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi,
JOB 29:5 mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu,
JOB 29:6 mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ.
JOB 29:7 “Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo were ọnọdụ m nʼama.
JOB 29:8 Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha, ndị okenye na-ahụkwa m ma guzo nʼụkwụ ha;
JOB 29:9 ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwu ma were aka ha kpuchie ọnụ ha;
JOB 29:10 olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ, ire ha na-araparakwa ha nʼakpo ọnụ.
JOB 29:11 Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m, ndị hụkwara m na-agba ama ọma maka m.
JOB 29:12 Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka, napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka.
JOB 29:13 Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m; emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ.
JOB 29:14 Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe, ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m.
JOB 29:15 Abụ m anya nye onye ìsì, bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ.
JOB 29:16 Abụ m nna nke onye nọ na mkpa; bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi.
JOB 29:17 Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume, si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu.
JOB 29:18 “Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m, na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.
JOB 29:19 Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri, na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile.
JOB 29:20 Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m, ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’
JOB 29:21 “Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị, ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m.
JOB 29:22 Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ. Okwu m na-ada juu na ntị ha.
JOB 29:23 Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo, na-aṅụkwa okwu m dịka ala si aṅụ mmiri ozuzo nʼọkọchị.
JOB 29:24 Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya; ìhè nke ihu m dị oke mkpa nye ha.
JOB 29:25 Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha; ebiri m dịka a ga-asị na m bụ onye eze nʼetiti ndị agha ya; na dịka onye na-akasị ndị na-eru ụjụ obi.
JOB 30:1 “Ma ugbu a, ha na-akwa m emo bụ ndị bụ ụmụntakịrị nʼebe m nọ, bụ ndị nna ha na-etorughị ndị m na-ezipụ ka ha na nkịta na-eso atụrụ m nọkọta.
JOB 30:2 Uru gịnị ka ike aka ha ga-abara m, ebe ọ bụ na ha adịghịkwa ike?
JOB 30:3 Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ, ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụ na-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị.
JOB 30:4 Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu, mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha.
JOB 30:5 A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha, a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi.
JOB 30:6 A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị. Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala.
JOB 30:7 Ha na-eme ụzụ nʼọhịa dịka ụmụ anụmanụ, na-ejikọta onwe ha nʼahịhịa toro nʼokpuru osisi.
JOB 30:8 Ha bụ ndị e ledara anya, ndị na-enweghị aha, e sitere nʼala ahụ chụpụ ha.
JOB 30:9 “Ma ugbu a, abụrụla m ihe ụmụ okorobịa ji abụ abụ ịkwa emo; abụrụkwala m okwu ha ji anọpụrụ ụbọchị.
JOB 30:10 Abụ m ihe ịsọ oyi nye ha, ha adịghị abịakwa m nso; ha anaghị egbu oge igbu m asọ mmiri nʼihu.
JOB 30:11 Ma ugbu a, ebe ọ bụ na Chineke atọpụla eriri ụta m ma kpagbuo m, o nwekwaghị ihe ha na-adịghị eme nʼihu m.
JOB 30:12 Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha. Ha na-esiri ụkwụ m ọnya, ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m.
JOB 30:13 Ha na-etiwasị ụzọ m, ha kwadoro mmekpa ahụ m. ‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu.
JOB 30:14 Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi; nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ.
JOB 30:15 Oke egwu abịakwasịla m; ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru, nchekwa m agabigala dịka igwe ojii.
JOB 30:16 “Ugbu a, ndụ m ji nwayọọ nwayọọ na-agabiga; ụbọchị ahụhụ ejidela m.
JOB 30:17 Abalị na-esewasị ọkpụkpụ m, ihe mgbu m nke na-ata ata enweghị ezumike.
JOB 30:18 Nʼoke ike ya, Chineke na-adịrị m ka uwe; ọ na-ekechi m dịka olu uwe m.
JOB 30:19 Ọ na-atụba m nʼime apịtị, mee ka m ghọọ ntụ na aja.
JOB 30:20 “Chineke m, anam etiku gị ma ị dịghị aza m; anam eguzo ọtọ, ma naanị anya ka i lere m.
JOB 30:21 Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere; i ji aka gị dị ike megide m.
JOB 30:22 Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe, ị na-eme ka m bụrụ onye na-akwụfegharị nʼoke ifufe nke mmiri.
JOB 30:23 Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ; ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ.
JOB 30:24 “Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala; mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka.
JOB 30:25 Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu; ọ bụ na mmụọ m erughị ụjụ nʼihi ndị ogbenye?
JOB 30:26 Ma mgbe m lere anya ihe ọma, ihe ọjọọ bịara; mgbe m lere anya ìhè, mgbe ahụ ka ọchịchịrị bịara.
JOB 30:27 Obi m anaghị ezu ike nʼime m; ụbọchị ahụhụ na-ezute m.
JOB 30:28 Ana m agagharị na-eji nji ma ọ bụghị nʼihi oke anwụ. Eguzola m ọtọ nʼọgbakọ ndị mmadụ tikuo ha ka ha nyere m aka.
JOB 30:29 Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa; onye ya na ikwighịkwighị na-esogharị.
JOB 30:30 Akpụkpọ ahụ m na-eji nji na-ekpe iwere; anụ ahụ m na-anụ ọkụ dịka ihe a kwanyere ọkụ.
JOB 30:31 Ụda ụbọ akwara m bụ ụda iru ụjụ; ụda ọja m bụkwa ụda iti mkpu akwa.
JOB 31:1 “Mụ na anya m gbara ndụ kpebie na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.
JOB 31:2 Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu; gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu?
JOB 31:3 Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume, nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ?
JOB 31:4 Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile, gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?
JOB 31:5 “Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụgha maọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ,
JOB 31:6 ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m, ọ ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta.
JOB 31:7 Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya, ọ bụrụ anya m na-edu obi m, ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ,
JOB 31:8 ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi, ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi.
JOB 31:9 “Ọ bụrụ na ọ gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ, maọbụ na m ezoola nʼọnụ ụzọ onye agbataobi m,
JOB 31:10 mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri, ka ndị ikom ọzọ dinaa ya.
JOB 31:11 Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere, bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe.
JOB 31:12 Ọ bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi; nke pụrụ ihopu ihe owuwe ubi m niile.
JOB 31:13 “Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezi nye nwoke maọbụ nwanyị ọbụla na-ejere m ozi mgbe ha nwere mkpesa megide m,
JOB 31:14 gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m? Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ jụrụ m ajụjụ?
JOB 31:15 Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha? Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị?
JOB 31:16 “Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa, ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi,
JOB 31:17 ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m, ma jụ inye ya ụmụ mgbei;
JOB 31:18 ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri, ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ.
JOB 31:19 Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa, maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe,
JOB 31:20 ma obi ha agọzighị m nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya.
JOB 31:21 Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ, nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe,
JOB 31:22 mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ, ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya.
JOB 31:23 Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke, nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a.
JOB 31:24 “Ọ bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo, maọbụ na m sị ọlaedo a nụchara anụcha, ‘Ị bụ ebe ndabere m.’
JOB 31:25 Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m, ihe nnweta nke aka m ritere nʼuru,
JOB 31:26 ọ bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya, maọbụ ọnwa nʼike nchawa ya,
JOB 31:27 nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo, maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe,
JOB 31:28 mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe, nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu.
JOB 31:29 “Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya,
JOB 31:30 ekwebeghị m ka ọnụ m mehie megide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ.
JOB 31:31 Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị. ‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’
JOB 31:32 Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama, nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije.
JOB 31:33 Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ, site nʼizobe mmehie m nʼime obi m,
JOB 31:34 nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ, si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche, nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi.
JOB 31:35 (“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị! Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m, ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ.
JOB 31:36 Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m, aga m eyinyekwa ya dịka okpueze.
JOB 31:37 Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile, aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.)
JOB 31:38 “Ọ bụrụ na ala m etie mkpu megide m, ọ bụrụ na olulu dị na ya ejupụta nʼanya mmiri,
JOB 31:39 ọ bụrụ na m eripịa ihe o mepụtara na-akwụghị ụgwọ, maọbụ mee ka mmụọ ndị bi nʼime ya daa mba,
JOB 31:40 ka ogwu pupụta nʼọnọdụ ọka wiiti, ka ahịhịa na-esi isi ọjọọ pupụtakwa nʼọnọdụ ọka balị.” Okwu Job agwụla.
JOB 32:1 Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa Job okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume.
JOB 32:2 Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke.
JOB 32:3 Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe.
JOB 32:4 Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị Job okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ.
JOB 32:5 Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe.
JOB 32:6 Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị: “Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara, ma unu bụ ndị okenye; ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ, hapụ ịgwa unu ihe m maara.
JOB 32:7 Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu; ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’
JOB 32:8 Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta.
JOB 32:9 Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe, ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi.
JOB 32:10 “Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị; mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.
JOB 32:11 Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu, egere m ntị na ntụgharị uche unu, oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu.
JOB 32:12 Egere m nnọọ unu ntị, ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie; ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya.
JOB 32:13 Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe; ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’
JOB 32:14 Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m, ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya.
JOB 32:15 “Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu; ike okwu agwụla ha.
JOB 32:16 M ga-echere, ugbu a ha deere duu, ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa?
JOB 32:17 Mụ onwe m ga-ekwu uche m; ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu,
JOB 32:18 nʼihi na okwu juru m ọnụ, ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m.
JOB 32:19 Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama, dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa.
JOB 32:20 Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike; aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi.
JOB 32:21 Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.
JOB 32:22 Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma, Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.
JOB 33:1 “Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m; ṅaakwa ntị nke ọma nʼihe niile m ga-ekwu.
JOB 33:2 Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu; okwu m dịkwa nʼọnụ ire m.
JOB 33:3 Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m; egbugbere ọnụ m na-ekwu naanị eziokwu nke m ma.
JOB 33:4 Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ.
JOB 33:5 Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike; jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka.
JOB 33:6 Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke; mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo.
JOB 33:7 Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ, ma ọ bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị.
JOB 33:8 “Ma ị kwuola ya na ntị m, anụrụ m okwu ndị ahụ niile,
JOB 33:9 ‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere; adị m ọcha na-enweghị mmehie ọbụla.
JOB 33:10 Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ; ọ na-ahụta m dịka onye iro ya.
JOB 33:11 Ọ na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ; ọ na-enyochakwa ụzọ m niile.’
JOB 33:12 “Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma, nʼihi na Chineke dị elu karịa mmadụ.
JOB 33:13 Gịnị mere i ji na-ekpesara ya na ọ dịghị azaghachi mmadụ ọbụla okwu?
JOB 33:14 Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ, ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ghara ịghọta ya.
JOB 33:15 Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị, mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra, mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha.
JOB 33:16 O nwere ike kwunye ha okwu na ntị ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị;
JOB 33:17 ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa, ka o si na nganga ya wezuga onwe ya,
JOB 33:18 ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu, chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha.
JOB 33:19 “Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina, ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu.
JOB 33:20 Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi, ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ.
JOB 33:21 Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi, ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a.
JOB 33:22 Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso, ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi.
JOB 33:23 Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ, dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ, onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya,
JOB 33:24 ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke, ‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili; achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya.
JOB 33:25 Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị, ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’
JOB 33:26 Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya, ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ, ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya.
JOB 33:27 Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha: ‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume, ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m;
JOB 33:28 ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili, ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’
JOB 33:29 “Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ ugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ.
JOB 33:30 Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili, ka ìhè nke ndụ si otu a mụkwasị ya.
JOB 33:31 “Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m; dere jii ka m kwuo okwu.
JOB 33:32 Ọ bụrụ na i nwere ihe ị chọrọ ikwu, zaghachi m; kwupụ okwu, nʼihi na achọrọ m ịgụ gị nʼonye ezi omume.
JOB 33:33 Ma ọ bụghị otu a, gee m ntị; dere jii, ka m zi gị amamihe.”
JOB 34:1 Mgbe ahụ Elihu sịrị:
JOB 34:2 “Nụrụ okwu m, unu ndị amamihe; gee m ntị unu ndị ikom nwere mmụta.
JOB 34:3 Ntị na-anwale okwu dịka ire si anụ ụtọ ihe oriri.
JOB 34:4 Ka anyị chọpụtara onwe anyị ihe ziri ezi; ka anyị nọkọta mụta ihe dị mma.
JOB 34:5 “Job na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume, ma Chineke na-anapụ m ikpe ziri ezi.
JOB 34:6 Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha ma a na-ahụta m dịka onye ụgha; ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị m ma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’
JOB 34:7 Olee nwoke dịka Job, nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri?
JOB 34:8 Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi, ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe.
JOB 34:9 Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya na mmadụ na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.’
JOB 34:10 “Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta. Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe Chineke nọ, bụ ime ajọ omume, bụrụkwa ihe dị anya nʼebe Onye pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi.
JOB 34:11 Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị, ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri.
JOB 34:12 Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na Chineke pụrụ ime ihe na-ezighị ezi, na Onye pụrụ ime ihe niile ga-ekpe ikpe nʼezighị ezi.
JOB 34:13 Onye họpụtara ya ịchị ụwa? Onye mere ya onye nlekọta ụwa niile?
JOB 34:14 Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche ya iweghachi mmụọ ya na nkuume ya,
JOB 34:15 mmadụ niile ga-alakọta nʼiyi, mmadụ niile ga-alaghachikwa nʼaja.
JOB 34:16 “Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a; gee ntị nʼokwu m.
JOB 34:17 Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị? Ị ga-ama Onye ezi omume na onye dị ike ikpe?
JOB 34:18 Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’ ma na-agwakwa ndị a mara aha ha sị, ‘Unu bụ ndị ajọ omume.’
JOB 34:19 Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide nye ụmụ ndị ikom eze, onye na-adịghị emenyere ndị ọgaranya, ma megbuo ndị ogbenye, nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya.
JOB 34:20 Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị; ndị ahụ na-ama jijiji ma gabiga; a na-ewezugakwa ndị dị ike ma ọ bụghị site nʼaka mmadụ.
JOB 34:21 “Anya ya na-elekwasị ụzọ niile nke ụmụ mmadụ; ọ na-ahụkwa nzọ ụkwụ ha niile.
JOB 34:22 Ọ dịghị ọchịchịrị dị, ọ dịghịkwa oke ọchịchịrị dị, ebe ndị na-eme ajọ ihe pụrụ izo.
JOB 34:23 Ọ dịghị mkpa ọ dịịrị Chineke ịga nʼihu inyocha ụmụ mmadụ, nke mere na ha ga-abịa nʼihu ya maka ikpe ikpe.
JOB 34:24 Na-ajụghị ajụjụ Chineke na-akụtu ndị a maara aha ha ma were ndị ọzọ dochie nʼọnọdụ ha.
JOB 34:25 Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile, ọ na-achụpụ ha nʼabalị mee ka ha ghọọ ndị e gwepịara egwepịa.
JOB 34:26 Nʼebe mmadụ niile ga-ahụ ha ka ọ na-ata ha ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,
JOB 34:27 nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha, ha enweghịkwa uche ilebanye anya nʼụzọ ya ọbụla.
JOB 34:28 Ha mere ka iti mkpu akwa nke ndị ogbenye ruo ya ntị, nke mere na ọ nụrụ akwa ndị nọ na mkpa.
JOB 34:29 Ma ọ bụrụ na ọ gba nkịtị, onye ga-ama ya ikpe? Ọ bụrụ na o zoo ihu ya, onye pụrụ ịhụ ya? Ma ya onwe ya na-achị isi nʼebe mmadụ na mba nọ,
JOB 34:30 igbochi nwoke na-adịghị atụ egwu Chineke ịchị obodo, ka ọ gharakwa ịbụ ihe ọnya nye ndị mmadụ.
JOB 34:31 “Ọ bụrụ na mmadụ a sị Chineke, ‘Abụ m onye ikpe mara ma agaghị m emehie kwa ọzọ.
JOB 34:32 Biko, zi m ihe ndị ahụ m na-apụghị ịhụ; ọ bụrụ na m emehiela, agaghị m emekwa ya ọzọ.’
JOB 34:33 Chineke ọ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ site na mkpebi gị mgbe ị jụrụ ichegharị? Gị onwe gị ga-ekpebi, ọ bụghị mụ; ya mere gwa m ihe ị mara.
JOB 34:34 “Ndị ikom ndị nwere nghọta na-ekwu si, ndị amamihe nụrụ okwu m na-asị m,
JOB 34:35 ‘Job na-ekwu okwu dịka onye na-amaghị ihe; okwu ya dị ka nke onye na-enweghị uche.’
JOB 34:36 Ọ ga-adị nnọọ mma ma a sị na a nwaa Job ruo nsọtụ maka ọsịsa ya dịka nke ajọ mmadụ!
JOB 34:37 Ọ na-atụkwasị nnupu isi nʼelu mmehie ya; na-akụ aka nʼetiti anyị nʼụzọ ịkwa emo, ma werekwa okwu nkwulu bara ụba megide Chineke.”
JOB 35:1 Mgbe ahụ, Elihu sịrị:
JOB 35:2 “Ị na-eche na nke a ziri ezi? Ị sịrị, ‘Na m ziri ezi ọ bụghị Chineke.’
JOB 35:3 Nʼagbanyeghị ihe ndị a, ị na-ajụ ya si, ‘Uru gịnị ka ọ baara m, gịnị bụ uru m ma ọ bụrụ na emehieghị m?’
JOB 35:4 “Ọ ga-amasị m ịzaghachi gị, zaghachikwa ndị enyi gị na ha nọ.
JOB 35:5 Lelie anya na eluigwe ma hụkwa. Legide mbara igwe na igwe oji niile, nke dị anya karịa gị.
JOB 35:6 Ọ bụrụ na i mehie, olee ụzọ nke a si metụta ya? Ọ bụrụ na mmehie gị bara ụba, gịnị ka nke a pụrụ ime ya?
JOB 35:7 Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya, maọbụ gịnị ka ọ na-anata site nʼaka gị?
JOB 35:8 Ajọ omume gị na-emetụta naanị mmadụ dịka gị, ma ezi omume gị na-emetụta naanị ụmụ ndị mmadụ.
JOB 35:9 “Ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa nʼihi ịba ụba nke mmegbu, ha na-arịọ arịrịọ enyemaka site nʼaka ndị dị ike.
JOB 35:10 Ma ọ dịghị onye na-asị, ‘Olee ebe Chineke onye kere m nọ, onye na-enye abụ nʼime abalị,
JOB 35:11 onye na-akụziri anyị ihe karịa ka ọ na-akụziri ụmụ anụ ọhịa nke ụwa, onye na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe karịa ụmụ nnụnụ nke igwe?’
JOB 35:12 Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa, nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume.
JOB 35:13 Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha; Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.
JOB 35:14 Ma ya bụrụzie nke a ị na-ekwu, ọ ga-esi aṅaa gee ntị mgbe ị na-ekwu na ị dịghị ahụ ya anya, na i burula ikpe gị bịa nʼihu ya na ị ga-anọkwa na-eche ya!
JOB 35:15 Ọzọ, nʼihi na iwe ya adịghị eweta ntaramahụhụ, nʼihi na ọ dịghị arịba ama ajọ omume ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta.
JOB 35:16 Ya mere, Job saghere ọnụ ya kwuo okwu dịka onye na-amaghị ihe; ka onye na-enweghị uche ọ na-ekwu okwu nkwukwasị efu.”
JOB 36:1 Elihu gara nʼihu sị:
JOB 36:2 “Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị na ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke.
JOB 36:3 Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya; aga m enye Onye kere m ezi omume.
JOB 36:4 Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha; onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị.
JOB 36:5 “Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya; ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime.
JOB 36:6 Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ, kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha.
JOB 36:7 Ọ dịghị ewepụ anya ya nʼebe ndị ezi omume nọ, kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze, bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.
JOB 36:8 Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe, jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike,
JOB 36:9 ọ na-agwa ha ihe ha mere, na ha sitere na nganga ha mehie.
JOB 36:10 Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka, na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme.
JOB 36:11 Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi, ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba, biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju.
JOB 36:12 Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị, ha ga-ala nʼiyi site na mma agha, ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe.
JOB 36:13 “Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha. Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.
JOB 36:14 Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha, nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche.
JOB 36:15 Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha; na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha.
JOB 36:16 “Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu, baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị, baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ.
JOB 36:17 Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị; ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị.
JOB 36:18 Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị; ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị.
JOB 36:19 Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gị ka ị ghara ịnọ na mkpagbu?
JOB 36:20 Anọla na-echere ka abalị bịa, mgbe a na-adọkpụrụ ndị ụmụ mmadụ site nʼụlọ ha pụọ.
JOB 36:21 Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe, bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu.
JOB 36:22 “E buliela Chineke elu nʼike ya, onye bụ onye ozizi dịka ya?
JOB 36:23 Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso, maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’?
JOB 36:24 Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu, bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ.
JOB 36:25 Mmadụ niile ahụzuola ya; ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya.
JOB 36:26 Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị. Ọnụọgụgụ afọ ya karịrị mmadụ ịchọpụta.
JOB 36:27 “Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha, nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile.
JOB 36:28 Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime ya mee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ.
JOB 36:29 Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii, ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya?
JOB 36:30 Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya na-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.
JOB 36:31 Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile na-enyejukwa ha nri afọ.
JOB 36:32 O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya, ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ.
JOB 36:33 Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri; ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso.
JOB 37:1 “Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji, na-amali elu site nʼọnọdụ ya.
JOB 37:2 Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya, na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta.
JOB 37:3 Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile, ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ.
JOB 37:4 Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya; ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe, mgbe olu ahụ dara dakwasị, ọ naghị egbochi amụma igbu egbu.
JOB 37:5 Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe; ọ na-eme ọtụtụ ihe ukwuu nke anyị na-apụghị ịghọta.
JOB 37:6 Nʼihi na ọ bụ ya na-agwa snoo okwu sị: ‘Daa nʼelu ala,’ na-agwakwa mmiri ozuzo okwu sị, ‘Zoo nnukwu mmiri ozuzo.’
JOB 37:7 Ka mmadụ o kere mata akaọrụ ya; ọ na-emekwa ka mmadụ ọbụla kwụsị ịdọgbu onwe ya nʼọrụ.
JOB 37:8 Ụmụ anụmanụ bi nʼọhịa na-agbaba zoo onwe; ha na-anọgide nʼebe obibi ha.
JOB 37:9 Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa, oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa.
JOB 37:10 Iku ume Chineke na-emepụta mkpụrụ mmiri, ogbu mmiri na-akpụkọtakwa.
JOB 37:11 Ọ na-eme ka igwe ojii jupụta na mmiri; na-eme ka amụma gbuo nʼime igwe ojii.
JOB 37:12 Site na ntụziaka ya ka ha na-echigharị onwe ha gburugburu imezu ihe ọbụla ọ chọrọ ka ha mee nʼelu ụwa niile.
JOB 37:13 Ọ na-ewebata igwe ojii maka ịta ndị mmadụ ahụhụ, na-eweta ya maka ime ka mmiri zokwasị elu ala igosi ịhụnanya ya.
JOB 37:14 “Job, gee ntị. Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ.
JOB 37:15 Ị maara otu Chineke si achịkọta igwe ojii na-eme ka amụma gbuo?
JOB 37:16 Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe, nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke?
JOB 37:17 Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa,
JOB 37:18 ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe nke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ?
JOB 37:19 “Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya; ebe ọ bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya.
JOB 37:20 A ga-agwa ya na m nwere okwu? Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya?
JOB 37:21 Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya ka ọ na-achake na mbara igwe, mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha.
JOB 37:22 Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta; Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa.
JOB 37:23 Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu, nʼikpe ikpe ya ziri ezi na ezi omume ya bara ụba, ọ naghị emegbu mmadụ.
JOB 37:24 Ya mere, ụmụ mmadụ na-atụ egwu ya, ọ bụ na o nweghị nsọpụrụ nye ndị niile obi ha maara ihe?”
JOB 38:1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
JOB 38:2 “Onye bụ onye a nke ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ìhè?
JOB 38:3 Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa nʼihi na enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị nke m chọrọ ka i nye m ọsịsa ha.
JOB 38:4 “Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa? Gwa m ma ọ bụrụ na ị ghọtara.
JOB 38:5 Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara, onye setịrị ihe ọtụtụ e ji tụọ ya nʼelu ya?
JOB 38:6 Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya, onye doro nkume mbụ e ji tọọ ntọala ya?
JOB 38:7 Mgbe kpakpando nke isi ụtụtụ zukọrọ bụọ abụ, ụmụ Chineke niile tisikwara mkpu ọṅụ ike?
JOB 38:8 “Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta,
JOB 38:9 mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe, werekwa ọchịchịrị meere ya akwa okike,
JOB 38:10 mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị, tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya,
JOB 38:11 mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya, nʼebe a ka a ga-akwụsị ebili mmiri mpako gị’?
JOB 38:12 “O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu, maọbụ mee ka chi ọbụbọ maara ọnọdụ ya,
JOB 38:13 ka o jide akụkụ niile nke ụwa aka ma site nʼụwa yọpụ ndị mmebi iwu?
JOB 38:14 Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara; ụdịdị ya na-egosipụta dịka uwe.
JOB 38:15 A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè, meekwa ka aka e weliri elu bụrụ nke a nyajiri.
JOB 38:16 “I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri, ka i jegharịala nʼebe miri emi nke ogbu mmiri?
JOB 38:17 O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ? Ka i jirila anya gị hụ ọnụ ụzọ nke onyinyo ọnwụ?
JOB 38:18 Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ? Gwa m, ma ọ bụrụ na ị maara ihe ndị a niile.
JOB 38:19 “Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi? Olee ebe ọchịchịrị bi?
JOB 38:20 Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi? Ị maara ụzọ e si eje ebe obibi ha?
JOB 38:21 Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a! Ị bikwaala ọtụtụ afọ.
JOB 38:22 “Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo, ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe,
JOB 38:23 nke m chekwara nye oge nsogbu, nʼoge ọgụ na nʼoge agha?
JOB 38:24 Kedụ ụzọ e si ejeru ebe a na-anọ ekesasị amụma egbe eluigwe, ebee ka e si ekesasị ifufe ọwụwa anyanwụ nʼelu ụwa?
JOB 38:25 Onye wara ụzọ maka oke mmiri ozuzo, onye kwa waara amụma na egbe eluigwe ụzọ?
JOB 38:26 Si otu a mee ka mmiri zokwasị ebe mmadụ na-ebighị, ala ọzara ebe ọ dịghị onye nọ nʼime ya,
JOB 38:27 ka mmiri ozuzo mee ka ala kpọrọ nkụ nweta mmiri iji mee ka ahịhịa pupụta nʼime ya.
JOB 38:28 Mmiri ozuzo o nwere nna? Onye mụrụ igirigi?
JOB 38:29 Site nʼakpanwa onye ka mkpụrụ mmiri si apụta? Onye kwa bụ nne oke oyi nke eluigwe,
JOB 38:30 nke na-eme ka mmiri kpụkọtaa dịrị ike dịka nkume, meekwa ka ihu ogbu mmiri kpụkọta?
JOB 38:31 “Ị pụrụ ikechi agbụ niile nke Pleiades? Ị pụrụ ịtọpụ ihe nkechikọta Orion?
JOB 38:32 Ị pụrụ ime ka igwe kpakpando pụta nʼoge ha maọbụ dupụta anụ ndọgbu Bịa na ụmụ ya ndị ọzọ?
JOB 38:33 Ị maara iwu na-achị ihe niile dị na mbara eluigwe? Ị pụrụ inye ha ike ịchị ụwa?
JOB 38:34 “Ị pụrụ iti mkpu ruo igwe ojii si otu a mee ka idee mmiri kpuchie gị?
JOB 38:35 Ị pụrụ izipụ amụma egbe eluigwe nʼụzọ ha? Ha na-asị gị, ‘Ebe a ka anyị nọ’?
JOB 38:36 Onye na-etinye amamihe nʼobi mmadụ, maọbụ na-enye oke ọkpa nghọta?
JOB 38:37 Onye nwere amamihe ịgụ igwe ojii niile dị na mbara eluigwe ọnụ? Onye kwa pụrụ ịhulata karama mmiri niile nke eluigwe niile,
JOB 38:38 mgbe aja dị nʼala siri ike, mgbe ọkpụrụkpụ aja dị nʼala na-akpụkọta nʼahụ ibe ha?
JOB 38:39 “Ọ bụ gị na-achụtara nne ọdụm ihe oriri, mee ka afọ ju ụmụ ọdụm
JOB 38:40 mgbe ha makpuuru nʼime ọgba ha, maọbụ mgbe ha zoro onwe ha na-eche anụ nʼọhịa?
JOB 38:41 Onye na-edoziri ugolọma ihe oriri ya, mgbe ụmụ ya na-etiku Chineke mkpu agụ, mgbe ha na-akpagharị na-achọ ihe oriri?
JOB 39:1 “Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa? O nweela mgbe ị ji hụ nne ele ka ọ na-amụpụta nwa ya?
JOB 39:2 Ị na-agụkọ ọnwa ole afọ ime ha na-adị tupu ha amụọ nwa ha. Ị maara oge ha na-amụ ụmụ ha?
JOB 39:3 Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha. Ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ha ebiekwa.
JOB 39:4 Ụmụ ha na-eto nʼọhịa gbasiekwa ike. Ha na-apụ, ha adịghị alaghachikwute ha ọzọ.
JOB 39:5 “Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya? Onye na-atọpụ agbụ e kere ya?
JOB 39:6 Nke m nyere ala ihe na-adịghị ka ọ bụrụ ebe obibi ha, ala nnu ahụ ka ọ bụrụ ụlọ ha.
JOB 39:7 Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya, ọ naghị anụkwa mbigbọ nke onye na-achị ya.
JOB 39:8 Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya, ebe ahụ ka ọ na-achọpụta ahịhịa ndụ ọbụla.
JOB 39:9 “Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi? Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri?
JOB 39:10 Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị? Ọ ga-akpụgharịrị gị ọgụ ị ji akọ ala?
JOB 39:11 Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne? Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ ndị ahụ siri ike ka ọ rụọ?
JOB 39:12 I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka site nʼebe ịzọcha ọka gị?
JOB 39:13 “Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya, ma a pụghị iji nku ya tụnyere nku na abụba nke ụgbala.
JOB 39:14 Ọ na-eyi akwa ya nʼala ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ.
JOB 39:15 Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha maọbụ na anụ ọhịa nwere ike zọrie ha.
JOB 39:16 Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya, ọ dịghị emetụta ya na ndọgbu nʼọrụ ya nwere ike i bụ nʼefu, ma ọ dịghị atụ egwu.
JOB 39:17 Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe maọbụ kenye ya oke na inwe uche.
JOB 39:18 Ma ọ na-agbalite ọsọ. Mgbe ọbụla ọ gbasara nku ya ịgba ọsọ, ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ịnyịnya ọchị.
JOB 39:19 “Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya, ka ọ bụ gị mere ka ajị ogologo ahụ o nwere dịrị nʼolu ya?
JOB 39:20 Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube, were ebube nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu?
JOB 39:21 Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya, ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu.
JOB 39:22 Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya; ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya.
JOB 39:23 Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya, ya na ùbe na arụa na-egbu maramara.
JOB 39:24 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala. Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe.
JOB 39:25 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’ Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha. Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha.
JOB 39:26 “Ọ bụ site nʼamamihe gị ka egbe ji efego nʼelu, gbasaakwa nku ya gaa nʼebe ndịda?
JOB 39:27 Ọ bụ gị nyere ugo iwu ifeli elu ma wuo akwụ ya nʼebe dị elu?
JOB 39:28 Nʼelu nkume dị elu ka ọ na-ebi nọọkwa ọnọdụ abalị; ọwara nkume dị elu bụ ebe e wusiri ike ya.
JOB 39:29 O bụ site nʼebe ahụ ka ọ na-esi enyochapụta ihe ọ ga-eburu.
JOB 39:30 Ụmụ ya na-amịchakwa ọbara, nʼihi na ebe ọ na-aga bụ ebe ọbụla ọ ga-ahụ ihe e gburu egbu.”
JOB 40:1 Onyenwe anyị zara Job sị:
JOB 40:2 “Onye ahụ na-arụso Onye pụrụ ime ihe niile ụka ọ pụrụ ịdọ ya aka na ntị? Ka onye ahụ na-ebo Chineke ebubo zaghachi ya.”
JOB 40:3 Mgbe ahụ, Job zaghachiri Onyenwe anyị sị:
JOB 40:4 “Abụ m onye na-erughị eru. Oleekwanụ ka m ga-esi zaghachi gị? Eji m aka m kpuchie ọnụ m.
JOB 40:5 Ekwuola m mbụ, ma enweghị m ọsịsa ọzọ kwuokwa ugboro abụọ, ma agaghị m ekwukwa ọzọ.”
JOB 40:6 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
JOB 40:7 “Kwadoo onwe gị dịka dimkpa; enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị, achọkwara m ka i nye m ọsịsa.
JOB 40:8 “Ị ga-aga nʼihu ikwujọ ikpe ziri ezi m? Ị ga-aga nʼihu maa m ikpe ka ị si otu a bụrụ onye ikpe gaara?
JOB 40:9 Ogwe aka gị ọ dị ike dịka nke Chineke? Olu gị ọ pụrụ ịda ụda dịka nke ya?
JOB 40:10 Were ebube na ịdị ukwuu chọọ onwe gị mma, yikwasịkwa onwe gị nsọpụrụ na ugwu dịka uwe.
JOB 40:11 Wụsa iwe gị dị ọkụ nʼebe ndị mpako niile nọ, weda ha nʼala,
JOB 40:12 lekwasịkwa ndị mpako niile anya mee ha ihe ihere, ma tiriekwa ndị na-emebi iwu ebe ha guzo.
JOB 40:13 Likọta ha niile nʼotu nʼaja, kpuchie ihu ha niile nʼala ili.
JOB 40:14 Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị, na aka nri nwere ike ịzọpụta gị.
JOB 40:15 “Lee enyi mmiri anya, bụ nke m kere dịka m si kee gị, ma ihe ọ na-eri bụ ahịhịa dịka ehi.
JOB 40:16 Lee ike dị nʼukwu ya, leekwa ike dị nʼime afọ ya.
JOB 40:17 Ọdụdụ ya ka ọ na-efegharị dịka osisi sida; akwara dị ya nʼahụ ka e jikọtara nke ọma.
JOB 40:18 Ọkpụkpụ ya niile dịka ogidi bronz nwere ụmị, ọkpụkpụ ụkwụ na aka ya dịka okporo igwe.
JOB 40:19 Ya onwe ya bụ otu nʼime ọrụ aka mbụ nke Chineke, ma naanị onye kere ya nwere ike iji mma agha bịa ya nso.
JOB 40:20 Ugwu na-enye ya ihe ọ na-eri. Nʼebe ahụ kwa ka ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ na-anọ egwuri egwu.
JOB 40:21 Ọ na-edina nʼokpuru ahịhịa na-eto nʼakụkụ mmiri, zookwa onwe ya nʼetiti ahịhịa riidi nʼapịtị.
JOB 40:22 Ahịhịa lotus na-eji ndo ya kpuchie ya, osisi pọpla nke dị nʼakụkụ mmiri gbara ya gburugburu.
JOB 40:23 Ọ bụladị mgbe ebili mmiri na-ama, ọ dịghị atụ egwu; ọ na-anọ nwayọọ, nʼagbanyeghị na mmiri Jọdan na-asọpụta na-asọju ya nʼọnụ.
JOB 40:24 Onye pụrụ ijide ya mgbe ọ na-ele anya, maọbụ were ọnya jide ya mapuo ya imi?
JOB 41:1 “Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatan maọbụ jiri ụdọ kegide ire ya bịada ya?
JOB 41:2 Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi ya maọbụ were ngu igwe mapuo agba ya?
JOB 41:3 Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere? Ọ ga-eji olu dị nro gwa gị okwu?
JOB 41:4 Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ ka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile?
JOB 41:5 Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ? Maọbụ kee ya eriri nye ya ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọ gị?
JOB 41:6 Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa? Ha ga-eke ya nʼetiti ndị mgbereahịa?
JOB 41:7 Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya maọbụ iji ùbe ndị ọkụ azụ dupuo isi ya?
JOB 41:8 Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka, ị gaghị echefu ọgụ ọ ga-alụso gị. Ị gakwaghị anwa ya ọzọ.
JOB 41:9 Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya. Naanị ilekwasị ya anya na-eyi egwu.
JOB 41:10 Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe. Ọ bụ onye pụrụ iguzogide m?
JOB 41:11 Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ? Ihe niile dị nʼokpuru eluigwe bụ nke m.
JOB 41:12 “Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan, na ike ya, na ụdịdị ya mara mma.
JOB 41:13 Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ? Onye nwekwara ike ịbanye nʼagba ya apịajiri okpukpu abụọ?
JOB 41:14 Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya, nke eze dị oke egwu gbara gburugburu?
JOB 41:15 Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoro nke e mechisịrị ike ka ha rapara nʼahụ ibe ha,
JOB 41:16 nke ọbụla dị ibe ya nso, na ikuku enweghị ike gafee nʼetiti ha.
JOB 41:17 E jikọtara ha ọnụ nke ọma, ha na-ejisi onwe ha ike, enweghị ike ikewa ha.
JOB 41:18 Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere; anya ya abụọ na-achakwa dịka anwụ ụtụtụ.
JOB 41:19 Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya, icheku ọkụ na-ekepụtakwa nʼọnụ ya.
JOB 41:20 Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta, dịka ukuru ọkụ nke na-esi nʼime mmiri na-agbọ nʼelu osisi achara.
JOB 41:21 Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku. Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ.
JOB 41:22 Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya, obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu.
JOB 41:23 Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma, ha siri ike na-apụghị inugharị ha.
JOB 41:24 Obi ya dị ike dịka nkume, dịka nkume e ji akwọ ihe.
JOB 41:25 Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ; ha na-alaghachi azụ nʼihi mmagharị ya.
JOB 41:26 O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya, o nwekwaghị ùbe igwe, maọbụ àkụ maọbụ ihe ọbụla a pịrị ọnụ ya apị nke pụrụ igbochi ya.
JOB 41:27 Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa; bronz dịkwa ka osisi rere ure nʼebe ọ nọ.
JOB 41:28 Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga, ịtụ ya nkume dị ka ịtụ ya igbugbo ọka.
JOB 41:29 Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka, ọ na-achị ọchị na mkpọtụ arụa na-eme.
JOB 41:30 Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ, nke na-ahapụ ụzọ nʼapịtị dịka igwe eji azọcha mkpụrụ ọka site nʼogbe ya.
JOB 41:31 Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite; ọ na-akpagharị oke osimiri ka ọ dị ka mmanụ otite dị nʼite.
JOB 41:32 Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga; mmadụ ga-eche na ọ osimiri nwere isi awọ.
JOB 41:33 O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya, o nweghị ihe na-emenye ya ụjọ.
JOB 41:34 Ọ na-eleda ndị mpako niile anya. Ọ bụkwa eze nʼebe ndị na-anya isi nọ.”
JOB 42:1 Mgbe ahụ, Job zara Onyenwe anyị sị:
JOB 42:2 “Amara m na ị pụrụ ime ihe niile; ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa.
JOB 42:3 Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata.
JOB 42:4 “Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu; m ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị ga-azakwa m.’
JOB 42:5 Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị.
JOB 42:6 Ya mere, ana m akpọ onwe m asị, na echegharịkwa nʼime ntụ na uzuzu.”
JOB 42:7 Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Job okwu, ọ tụgharịrị gwa Elifaz onye Teman okwu sị ya, “Ana m ewesa gị na ndị enyi gị abụọ iwe, nʼihi na ihe unu kwuru banyere m ezighị ezi dịka nke ohu m Job kwuru.
JOB 42:8 Ugbu a, werenụ oke ehi asaa na ebule asaa, jekwuru ohu m bụ Job ka o jiri ha chụọrọ unu aja nsure ọkụ, ohu m bụ Job ga-ekpekwara unu ekpere. Aga m anabatakwa ekpere ọ ga-ekpe nʼihi unu. Agaghị m alakwa unu nʼiyi nʼihi okwu nzuzu unu. Unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m dịka ohu m Job si kwuo.”
JOB 42:9 Ya mere, Elifaz onye Teman, na Bildad, onye Shu, na Zofa, onye Naaman mere dịka Onyenwe anyị si nye ha nʼiwu. Onyenwe anyị nabatakwara ekpere nke Job kpere nʼihi ndị enyi ya.
JOB 42:10 Mgbe Job kpesịrị ekpere maka ndị enyi ya, Onyenwe anyị mekwara ka ọ baa ụba ọzọ. O nyekwara ya okpukpo abụọ nke ihe niile o nwere na mbụ.
JOB 42:11 Mgbe ahụ, ụmụnne ya ndị ikom na ụmụnne ya ndị inyom, na ndị enyi ya niile bịara soro ya rie oriri nʼụlọ ya, na-akasị ya obi nʼihi iru ụjụ ya niile. Ha kasịkwara ya obi nʼihi ọnwụnwa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya. Ha niile nʼotu nʼotu nyere ya onyinye ọlaọcha na mgbaaka ọlaedo.
JOB 42:12 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gọziri Job nʼoge ikpeazụ nke ndụ ya karịa ka o si gọzie ya na mbụ. Job nwere puku atụrụ iri na anọ na puku ịnyịnya kamel isii na puku ehi abụọ na otu puku ịnyịnya ibu.
JOB 42:13 Chineke mekwara ka ọ mụta ụmụ ndị ikom asaa, na ụmụ ndị inyom atọ ọzọ.
JOB 42:14 Ndị a bụ aha ụmụ ya ndị inyom: nke mbụ bụ Jimaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerin-Hapuk.
JOB 42:15 Nʼala ahụ niile, o nweghị ụmụ agbọghọ mara mma dịka ụmụ ndị inyom Job ndị a. Job mekwara ka ha bụrụ ndị ga-eso ụmụ ya ndị ikom keta oke nʼihe niile o nwere.
JOB 42:16 Job nọgidekwara ndụ narị afọ na iri afọ anọ ọzọ. Ọ hụrụ ụmụ ya, na ụmụ ha ruo ọgbọ nke anọ.
JOB 42:17 Job nwụrụ mgbe o mere ezigbo agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.
PSA 1:1 Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ, onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu; onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ.
PSA 1:2 Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,
PSA 1:3 Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.
PSA 1:4 Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị.
PSA 1:5 Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe; ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume.
PSA 1:6 Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche. Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.
PSA 2:1 Gịnị mere mba niile ji agba izu nzuzo? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?
PSA 2:2 Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.
PSA 2:3 Ha na-asị, “Ka anyị tijie mkpọrọ igwe niile ha kere anyị ma tufukwaa ha, nwere onwe anyị.”
PSA 2:4 Onye na-anọdụ nʼeluigwe na-achị ọchị. Onyenwe anyị na-akwa ha emo.
PSA 2:5 Mgbe ahụ, ọ na-eji iwe baara ha mba mee ka ụjọ jupụta ha obi nʼihi oke iwe ya.
PSA 2:6 “Mụ onwe m eguzobela m eze m na Zayọn, ugwu m dị nsọ.”
PSA 2:7 Aga m ekwusa iwu Onyenwe anyị: Ọ sịrị m, “Ị bụ Ọkpara m; taa abụrụla m nna gị.
PSA 2:8 Rịọọ m, aga m enye gị mba niile nke ụwa ka ha bụrụ ihe nketa gị.
PSA 2:9 Ị ga-eji mkpara igwe chịa ha, tipịa ha dịka onye na-akpụ ite si etipịa ite ndị ọ kpụrụ na-adịghị mma.”
PSA 2:10 Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche; ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa.
PSA 2:11 Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe; jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
PSA 2:12 Sutukwanụ Ọkpara ahụ ọnụ ka iwe ghara iwe ya, ka unu ghara ị bụ ndị a lara nʼiyi nʼụzọ unu. Nʼihi na iwe ya pụrụ ịmalite nʼotu ntabi anya. Ndị niile na-eme ya ebe mgbaba ha bụ ndị a gọziri agọzi.
PSA 3:1 Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ. O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.
PSA 3:2 Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị, “Chineke agaghị azọpụta ya.” Sela
PSA 3:3 Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m; I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.
PSA 3:4 Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela
PSA 3:5 Edinara m ala, hie ụra, ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.
PSA 3:6 A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu, agaghị m atụ egwu ọbụla.
PSA 3:7 Bilie Onyenwe anyị! Zọpụta m Chineke m! Tie ndị iro m niile aka nʼagba; tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.
PSA 3:8 Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa. Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. Sela
PSA 4:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nke a na-eji ụbọ akwara akpọ. Zaa m mgbe m na-akpọku gị Chineke m, gị onye ezi omume; Napụta m site nʼihe mgbu m, meere m ebere, nụrụkwa ekpere m.
PSA 4:2 Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere? Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie? Sela
PSA 4:3 Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya; ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.
PSA 4:4 Maanụ jijiji, unu emehiekwala; mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu; nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela
PSA 4:5 Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu, chụkwaranụ ya aja ezi omume.
PSA 4:6 Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?” Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị.
PSA 4:7 Were ọṅụ mejupụta obi m karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu.
PSA 4:8 Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo, nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị, na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.
PSA 5:1 Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Ọ bụ opi ka e ji abụ ya. Abụ Ọma nke Devid. Onyenwe anyị, biko, nụrụ ekpere m tulee ịsụ ude m.
PSA 5:2 Geekwa ntị nʼakwa arịrịọ m, gị Chineke onye bụ eze m. Nʼihi na ọ bụ naanị gị ka m na-akpọku.
PSA 5:3 Ụtụtụ ụbọchị niile, O Onyenwe anyị, ị ga-anụ olu m; aga m ekwupụtara gị ihe niile na-akpa m mkpa. Aga m elekwa anya ọsịsa gị.
PSA 5:4 Ị bụ Chineke, onye ihe ọjọọ ọbụla anaghị atọ ụtọ; gị na ndị ajọ omume apụghị ibikọta.
PSA 5:5 Ndị mpako agaghị eguzo nʼihu gị. Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị.
PSA 5:6 Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi; Onyenwe anyị kpọrọ ndị ogbu mmadụ niile na ndị aghụghọ niile asị.
PSA 5:7 Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị, site nʼoke ịhụnanya gị; aga m ejikwa ịtụ egwu kpọọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwuu gị dị.
PSA 5:8 Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị nʼihi ndị iro m; mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m.
PSA 5:9 Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi, a pụghị ịtụkwasị okwu ọbụla si ha nʼọnụ pụta obi. Akpịrị ha bụ ili ghere oghe; ha ji ire ha ekwu okwu ụgha.
PSA 5:10 Maa ha ikpe, Chineke. Mee ka nzube ọjọọ ha niile bụrụ ọdịda ha. Chụpụ ha nʼihi ịba ụba nke ọtụtụ mmehie ha, nʼihi na ha enupula isi megide gị.
PSA 5:11 Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa; mee ka ha nọgide na-eti mkpu ọṅụ. Were aka nchebe gị kpuchie ha, ka ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ṅụrịa ọṅụ nʼime gị.
PSA 5:12 Nʼezie, O Onyenwe anyị, ị na-agọzi onye ezi omume. Ị na-eji ihuọma gị gbaa ha gburugburu dịka ọta.
PSA 6:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke e ji ụbọ akwara abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe. Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị.
PSA 6:2 Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike. Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu.
PSA 6:3 Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị?
PSA 6:4 Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m; nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m.
PSA 6:5 Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị. O nwere onye na-eto gị site nʼala ili?
PSA 6:6 Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude. Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri, ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m.
PSA 6:7 Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute; ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m.
PSA 6:8 Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe, nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile.
PSA 6:9 Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere. Ọ nabatala ekpere m.
PSA 6:10 Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme. Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.
PSA 7:1 Abụ Shiggaion nke Devid, nke ọ bụkuru Onyenwe anyị banyere Kush, onye Benjamin. Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara; zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ,
PSA 7:2 ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm, ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m.
PSA 7:3 O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a; ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha.
PSA 7:4 Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ, maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m.
PSA 7:5 Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m; ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m, mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. Sela
PSA 7:6 Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị, bilie megide oke iwe ndị iro m; teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi.
PSA 7:7 Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu, ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha.
PSA 7:8 Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe. Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị, na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu.
PSA 7:9 O Chineke onye ezi omume, onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ, mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike.
PSA 7:10 Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta m, ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi.
PSA 7:11 Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị.
PSA 7:12 Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị, ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ, ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya.
PSA 7:13 Ọ kwadoola ngwa agha niile nke ọnwụ; ọ na-eme ka àkụ ya bụrụ nke na-ere ọkụ.
PSA 7:14 Onye ọbụla dị ime ajọ ihe, na-atụrụ ime okwu na ụka mụpụtakwa ngharịpụ nke ụgha na-eweta.
PSA 7:15 Ma onye ahụ na-egwu olulu na-adaba nʼime olulu ahụ o gwuru.
PSA 7:16 Nsogbu ahụ ọ kpaliri na-abịakwasị ya ihe ike ahụ ọ kwadooro na-alaghachikwa azụ dakwasị ya nʼisi.
PSA 7:17 Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya, aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.
PSA 8:1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit. O Onyenwe anyị Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe.
PSA 8:2 Site nʼotuto ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara, ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị, ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ.
PSA 8:3 Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe, hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ, mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando i tinyere nʼọnọdụ ha,
PSA 8:4 gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha?
PSA 8:5 I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze.
PSA 8:6 I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.
PSA 8:7 Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile,
PSA 8:8 na nnụnụ niile, na azụ niile, na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.
PSA 8:9 O Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.
PSA 9:1 Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Ọnwụ nke Ọkpara.” Abụ ọma Devid. O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị, aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme.
PSA 9:2 Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị, aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.
PSA 9:3 Ndị iro m na-alaghachi azụ, ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị.
PSA 9:4 I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi, nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi.
PSA 9:5 I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi, hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 9:6 Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m, I hopukwala obodo ha niile. Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ.
PSA 9:7 Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi.
PSA 9:8 Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe; jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile.
PSA 9:9 Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu. Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.
PSA 9:10 Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi, nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.
PSA 9:11 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn. Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya.
PSA 9:12 Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe; ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya.
PSA 9:13 O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m! Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ,
PSA 9:14 ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị nʼọnụ ụzọ ama niile nke ada Zayọn, nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị.
PSA 9:15 Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru; ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha.
PSA 9:16 Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi; ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. Sela
PSA 9:17 Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili; nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke.
PSA 9:18 Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa; olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu.
PSA 9:19 O Onyenwe anyị, bilie! Ekwela ka mmadụ nwee mmeri ọbụla nʼebe ị nọ; ka e kpee mba niile ikpe nʼihu gị.
PSA 9:20 O Onyenwe anyị! Mee ka ha maa jijiji nʼoke egwu; mee ka mba niile ghọta na ha bụ naanị mmadụ. Sela
PSA 10:1 Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya? Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu?
PSA 10:2 Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike, ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya.
PSA 10:3 Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya, ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ.
PSA 10:4 Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke, nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya.
PSA 10:5 Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma; ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ; ọ na-elelị ndị iro ya niile.
PSA 10:6 Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m. Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.”
PSA 10:7 Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ, nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa.
PSA 10:8 Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche, nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ, na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha.
PSA 10:9 Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla, ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye. Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye.
PSA 10:10 Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya, ọ na-azọpịakwa ha.
PSA 10:11 Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola. O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.”
PSA 10:12 Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị, echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka.
PSA 10:13 Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya? Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya, “Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”?
PSA 10:14 Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute, ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha. Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi, nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna.
PSA 10:15 Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ, kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile nke a na-apụghị ịchọpụta.
PSA 10:16 Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile.
PSA 10:17 O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu; ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi,
PSA 10:18 Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu, ka mmadụ efu, onye e kere eke, ghara imenye ha egwu ọzọ.
PSA 11:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m. Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị, “Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.”
PSA 11:2 Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha; ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha, zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ, ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.
PSA 11:3 Mgbe a na-ebibi ntọala niile, gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?
PSA 11:4 Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya; Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe. Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme; anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.
PSA 11:5 Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule, ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya, ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.
PSA 11:6 Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume dịka mmiri ozuzo; oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.
PSA 11:7 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya; ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.
PSA 12:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma nke Devid. Onyenwe anyị, nyere anyị aka! Nʼihi na ndị ezi omume agwụla! Ndị kwesiri ntụkwasị obi anọkwaghị nʼetiti ụmụ mmadụ.
PSA 12:2 O nwekwaghị onye eziokwu dị nʼọnụ ya nye onye agbataobi ya. Egbugbere ọnụ onye ọbụla na-ekwukwa okwu ire ụtọ, maọbụ aghụghọ dị nʼobi ha.
PSA 12:3 Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi.
PSA 12:4 Ndị na-asị, “Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri; egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?”
PSA 12:5 “Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude, aga m ebili ugbu a, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha.”
PSA 12:6 Okwu ọnụ Onyenwe anyị niile zuruoke, ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ, nke a nụchara ugboro asaa.
PSA 12:7 O Onyenwe anyị, i ga-edebe anyị nʼudo ma sitekwa nʼaka ndị dị otu a chebe anyị ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 12:8 Ndị ajọ omume na-ejegharị nʼebe niile mgbe a na-eto ihe ọjọọ nʼetiti ụmụ mmadụ.
PSA 13:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị? Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị?
PSA 13:2 Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m? Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m?
PSA 13:3 Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m. Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ;
PSA 13:4 mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.
PSA 13:5 Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ; mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị.
PSA 13:6 Aga m abụku Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.
PSA 14:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ọrụ aka ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.
PSA 14:2 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta onye nke na-achọ Chineke.
PSA 14:3 Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị, otu onye.
PSA 14:4 Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe? Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri, ha adịghị akpọkukwa Onyenwe anyị.
PSA 14:5 Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu, nʼihi na Chineke nọ nʼetiti ndị ezi omume.
PSA 14:6 Unu ndị ajọ omume na-emebi atụmatụ ndị ogbenye, ma Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba ha.
PSA 14:7 A sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta! Mgbe Onyenwe anyị ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha, ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!
PSA 15:1 Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị, onye pụrụ ịnọgide nʼụlọnsọ ukwu gị? Onye pụrụ ibi nʼugwu nsọ gị?
PSA 15:2 Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta, onye na-arụ ọrụ ezi omume, onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya.
PSA 15:3 Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ, onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ, na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya,
PSA 15:4 onye na-eleda onye ajọ omume anya, ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị, onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere, ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya,
PSA 15:5 onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma, onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha. Onye na-eme ihe ndị a agaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.
PSA 16:1 Abụ miktam nke Devid. Chebe m, O Chineke, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.
PSA 16:2 A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m, e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.”
PSA 16:3 Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a, “Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ.”
PSA 16:4 Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba. Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara nye chi ndị a, maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha.
PSA 16:5 Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m; ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza.
PSA 16:6 Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma; nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.
PSA 16:7 Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ; ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme.
PSA 16:8 Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile. Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.
PSA 16:9 Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ; aga m anọkwa nʼudo.
PSA 16:10 Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure.
PSA 16:11 I gosila m ụzọ ndụ; ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị; ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.
PSA 17:1 Ekpere Devid. O Onyenwe anyị, nụrụ arịrịọ m ziri ezi, nụrụkwa mkpu akwa m. Gee ntị nʼekpere m nʼihi na o siteghị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ.
PSA 17:2 Ka mkpepụta m si nʼaka gị bịa; ka anya gị hụ ihe ziri ezi.
PSA 17:3 Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m, i letala m nʼabalị, nwalekwaa m, ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere, na ọnụ m ekwuhiebeghị.
PSA 17:4 Ndị mmadụ agbalịala inye m ngarị ma anaghị m ekwe ka mụ na ndị na-eme ihe ike nwee mmekọrịta nʼihi iwu sitere nʼegbugbere ọnụ gị.
PSA 17:5 Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị, ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya.
PSA 17:6 Ana m akpọku gị, O Chineke, nʼihi na amaara m na ị ga-aza m; gee m ntị ma nụrụ ekpere m.
PSA 17:7 Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube; gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha.
PSA 17:8 Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m na ndo nke nku gị,
PSA 17:9 site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu, ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m.
PSA 17:10 Ha anaghị eme ebere, ha bụ ndị afọ tara mmiri, okwu ịnya isi juru ha ọnụ.
PSA 17:11 Ha achọpụtala ebe m nọ, ugbu a, ha gbara m gburugburu, ha ji anya nkọ, jikerekwa ịtụ m nʼala.
PSA 17:12 Ha ka ọdụm agụụ na-agụ nke zoro onwe ya nʼọhịa, dịka ọdụm dị ike na-eche ihe ọ ga-adọgbu.
PSA 17:13 Onyenwe anyị, bilie guzogide ha, tigbuo ha. Jiri mma agha gị zọpụta m site nʼaka ndị ajọ omume.
PSA 17:14 O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼaka ndị dị otu a, site nʼaka ndị ụgwọ ọrụ ha bụ nʼụwa a. Ka ihe ịkpakọbara debere ndị ajọ omume jupụta afọ ha, ka afọ jukwa ụmụ site nʼihe ndị a, ka ha hapụrụ ihe fọdụrụ nye ụmụntakịrị ha.
PSA 17:15 Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume; mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.
PSA 18:1 Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu Onyenwe anyị. Ọ bụụrụ Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị: O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m.
PSA 18:2 Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya.
PSA 18:3 Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
PSA 18:4 Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ; ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.
PSA 18:5 Ụdọ nke ili kere m gburugburu, ọnya nke ọnwụ guzogidere m.
PSA 18:6 Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị; etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka; akwa m rutekwara ya ntị, o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
PSA 18:7 Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji, ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.
PSA 18:8 Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta, ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta; icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.
PSA 18:9 O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
PSA 18:10 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, o feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
PSA 18:11 O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.
PSA 18:12 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii ji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga.
PSA 18:13 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ; olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
PSA 18:14 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa, o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.
PSA 18:15 E kpughere ala ala nke oke osimiri, gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, site nʼịba mba gị, O Onyenwe anyị, na nkuume si gị nʼimi pụta.
PSA 18:16 O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
PSA 18:17 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.
PSA 18:18 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m, ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.
PSA 18:19 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.
PSA 18:20 Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị; ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.
PSA 18:21 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị, ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.
PSA 18:22 Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.
PSA 18:23 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.
PSA 18:24 Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya.
PSA 18:25 Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.
PSA 18:26 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.
PSA 18:27 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala.
PSA 18:28 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu, Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
PSA 18:29 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ, sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.
PSA 18:30 Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
PSA 18:31 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị?
PSA 18:32 Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.
PSA 18:33 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele; Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
PSA 18:34 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.
PSA 18:35 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, aka nri gị na-akwagidekwa m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.
PSA 18:36 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ, ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.
PSA 18:37 Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha; alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.
PSA 18:38 Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite. Ha dara nʼokpuru ụkwụ m.
PSA 18:39 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha, i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.
PSA 18:40 I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ. Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị.
PSA 18:41 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.
PSA 18:42 Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu; a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ.
PSA 18:43 Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ ị meela m onyeisi nke ọtụtụ mba; ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.
PSA 18:44 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.
PSA 18:45 Obi na-ada ha mba; ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.
PSA 18:46 Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m! Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m.
PSA 18:47 Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ, onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m,
PSA 18:48 onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro, napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.
PSA 18:49 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche, aga m abụku aha gị abụ otuto.
PSA 18:50 Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu; Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada, nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 19:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.
PSA 19:2 Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma.
PSA 19:3 Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, ma a na-anụ ụda ha.
PSA 19:4 Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.
PSA 19:5 Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta, dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi.
PSA 19:6 Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe, bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.
PSA 19:7 Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.
PSA 19:8 Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè.
PSA 19:9 Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi.
PSA 19:10 Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.
PSA 19:11 Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị; ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.
PSA 19:12 Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile? Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m.
PSA 19:13 Chebe m, ka m ghara ilezi anya mehie megide gị. Ekwela ka ha na-achị achị na ndụ m. Mgbe ahụ ka m ga-abụ onye zuruoke, onye nwere onwe ya site nʼebe ihe ọjọọ niile nke mmehie dị.
PSA 19:14 Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m, ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile, bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.
PSA 20:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị; ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị.
PSA 20:2 Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka, ma site na Zayọn kwagide gị.
PSA 20:3 Ya chetakwa aja niile ị chụrụ, ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela
PSA 20:4 Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ, mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma.
PSA 20:5 Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri, buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile.
PSA 20:6 Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ; ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya, zọpụta ma zakwaa ya.
PSA 20:7 Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha; ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi.
PSA 20:8 Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa, ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm.
PSA 20:9 O Onyenwe anyị, zọpụta eze! Zakwaa anyị mgbe anyị kpọkuru gị!
PSA 21:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, lee na eze na-aṅụrị ọṅụ nʼike gị. Obi na-atọkwa ya ụtọ nke ukwuu nʼihi mmeri niile i nyere ya!
PSA 21:2 I nyela ya ihe obi ya chọrọ; i mekwaara ya ihe niile ọ rịọrọ gị! Sela
PSA 21:3 I ji ngọzị bara ụba nabata ya, ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi.
PSA 21:4 Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 21:5 Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya, ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya.
PSA 21:6 Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị.
PSA 21:7 Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ.
PSA 21:8 Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile; aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị.
PSA 21:9 Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ, ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha, ọkụ ya ga-erepịakwa ha.
PSA 21:10 Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi, ụmụ ha kwa site, nʼetiti ụmụ mmadụ.
PSA 21:11 Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị, maọbụ tụpụta atụmatụ ọjọọ, ha agaghị emezu ebumnuche ha.
PSA 21:12 Nʼihi na i ga-eme ka ha gbaghachi azụ mgbe i kwere ụta gị tụgide ha nʼihu.
PSA 21:13 O Onyenwe anyị, ka e bulie gị elu nʼihi ike gị; anyị ga-abụ abụ ma tokwaa ike gị.
PSA 22:1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ nke “Nne ele nke ụtụtụ.” Abụ Ọma Devid. Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m? Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m, nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile?
PSA 22:2 O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m, nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere.
PSA 22:3 Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ; ị bụ otuto ndị Izrel.
PSA 22:4 Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi; ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha.
PSA 22:5 Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara; ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi.
PSA 22:6 Abụ m idide, abụghị m mmadụ; onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya.
PSA 22:7 Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị; na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị.
PSA 22:8 “O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi; ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya. Ya napụta ya ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya.”
PSA 22:9 Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara.
PSA 22:10 Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị. Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.
PSA 22:11 Anọla m ebe dị anya, nʼihi na nsogbu dị nso. Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.
PSA 22:12 Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu; oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu.
PSA 22:13 Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa asaghepụla ọnụ ha megide m.
PSA 22:14 A wụpụla m dịka mmiri, ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha. Obi m agbazela dịka mmanụ, obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m.
PSA 22:15 Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime. Ire m na-araparakwa m nʼọnụ, nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ.
PSA 22:16 Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, ha adupuola m aka m na ụkwụ m.
PSA 22:17 A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ; ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị
PSA 22:18 Ha na-eke uwe m nʼetiti ha, ha sitere nʼife nza kee uwe m.
PSA 22:19 Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya; gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka.
PSA 22:20 Napụta ndụ m site na mma agha, site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa.
PSA 22:21 Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a, zọpụta m site na mpi atụ ndị a.
PSA 22:22 Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m; nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.
PSA 22:23 Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya; unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya! Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!
PSA 22:24 Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya maọbụ kwaa ya emo; o lefughị ya anya kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya.
PSA 22:25 Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị.
PSA 22:26 Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 22:27 Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, ma laghachikwute Onyenwe anyị. Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche ga-akpọ isiala nʼihu ya.
PSA 22:28 Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị, ọ na-achịkwa mba niile.
PSA 22:29 Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.
PSA 22:30 Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi; a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị.
PSA 22:31 Ha ga-ekwusa ezi omume ya nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị nʼihi na o meela ya.
PSA 23:1 Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.
PSA 23:2 Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,
PSA 23:3 ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya.
PSA 23:4 A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi.
PSA 23:5 Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke.
PSA 23:6 Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.
PSA 24:1 Abụ Ọma Devid. Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị; ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
PSA 24:2 Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, o mekwara ka o guzosie ike.
PSA 24:3 Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị? Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya?
PSA 24:4 Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ.
PSA 24:5 Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị, natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha.
PSA 24:6 Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. Sela
PSA 24:7 Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka eze ebube nwee ike ịbata.
PSA 24:8 Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dimkpa na dike. Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dike nʼagha.
PSA 24:9 Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa.
PSA 24:10 Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ya bụ Eze ebube! Sela
PSA 25:1 Abụ Ọma Devid. Ọ bụ na gị Onyenwe anyị ka m tụkwasịrị obi m.
PSA 25:2 O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m. Ekwela ka ihere mee m, ekwekwala ka ndị iro m merie m.
PSA 25:3 Ihere agaghị eme onye ọbụla olileanya ya dị na gị, ma ihere ga-eme ha bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ.
PSA 25:4 O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile.
PSA 25:5 Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị.
PSA 25:6 Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie.
PSA 25:7 Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.
PSA 25:8 Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.
PSA 25:9 Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya.
PSA 25:10 Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya.
PSA 25:11 Nʼihi aha gị, O Onyenwe anyị, gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu.
PSA 25:12 Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu Onyenwe anyị? O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya.
PSA 25:13 Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba, ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ.
PSA 25:14 Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.
PSA 25:15 Anya m abụọ na-elegide Onyenwe anyị mgbe niile; nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta.
PSA 25:16 Chee m ihu ma gosi m ebere gị, nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa.
PSA 25:17 Ihe mgbu nke obi m abaala ụba, napụta m site nʼobi mwute.
PSA 25:18 Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya. Biko, gbaghara m mmehie m niile.
PSA 25:19 Lee ka ndị iro m si mụbaa, ha ji oke iwe kpọọ m asị.
PSA 25:20 Chebe ndụ m ma gbapụta m; ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ
PSA 25:21 Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu, nʼihi na olileanya m dị nʼime gị.
PSA 25:22 O Chineke, Gbapụtakwa Izrel, site na nsogbu ya niile.
PSA 26:1 Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị, biko kpepụta m, nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke; atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi, na-eleghị anya nʼazụ.
PSA 26:2 Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m, nyochaa obi m na echiche m.
PSA 26:3 Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m. Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị.
PSA 26:4 Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla. Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ.
PSA 26:5 Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị. Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.
PSA 26:6 Ana m asacha aka m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ, na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị.
PSA 26:7 Ana m abụkwa abụ ekele, jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile.
PSA 26:8 O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya, ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya.
PSA 26:9 Ebibikọtala mụ na ndị mmehie, ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara,
PSA 26:10 ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ, aka nri ha jupụtakwara na ngarị.
PSA 26:11 Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke; gbapụta m ma meere m ebere.
PSA 26:12 Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị; aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ.
PSA 27:1 Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
PSA 27:2 Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.
PSA 27:3 Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; ọ bụladị na agha adaa imegide m, nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi.
PSA 27:4 Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.
PSA 27:5 Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume.
PSA 27:6 Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị.
PSA 27:7 Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị. Meere m ebere, zaa m.
PSA 27:8 Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.
PSA 27:9 Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O Chineke, Onye nzọpụta m, ahapụkwala m.
PSA 27:10 Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m, Onyenwe anyị ga-anabata m.
PSA 27:11 Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị; duo m nʼụzọ kwesiri nʼihi ndị na-akpagbu m.
PSA 27:12 Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha, ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m, ha na-ekupụ ihe ike dịka ume.
PSA 27:13 Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ.
PSA 27:14 Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.
PSA 28:1 Abụ Ọma Devid. Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku; gị bụ Oke nkume m, agbala m nkịtị. Ọ bụrụ na ị jụ ịza m, aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu.
PSA 28:2 Nụrụ arịrịọ m maka ebere dịka m na-akpọku gị maka enyemaka, mgbe m chịlịri aka m abụọ elu nʼEbe gị Kachasị Nsọ.
PSA 28:3 Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ, tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe, ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo, ma ha bu iro nʼime obi ha.
PSA 28:4 Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha na omume ha kwesiri; kwụghachi ha maka ihe aka ha mere, ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa.
PSA 28:5 Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị, ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ, ọ ga-akwada ha nʼala, ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ.
PSA 28:6 Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere.
PSA 28:7 Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m; ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka. Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ, aga m ejikwa abụ m na-eto ya.
PSA 28:8 Onyenwe anyị bụ ike nke ndị ya, ebe mgbaba e wusiri ike nke nzọpụta dịịrị onye ya etere mmanụ.
PSA 28:9 Zọpụta ndị gị, gọzikwaa ihe nketa gị; buuru ha onye ọzụzụ atụrụ, na-ekukwa ha ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 29:1 Abụ Ọma Devid. Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya.
PSA 29:2 Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya; kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya.
PSA 29:3 Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri; olu Chineke dị ebube na-ada ike ike, olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe nʼelu oke osimiri.
PSA 29:4 Olu Onyenwe anyị dị ike, olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube.
PSA 29:5 Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida; Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn.
PSA 29:6 Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi, ọ na-eme ka Siriọn wulie elu dịka nwa atụ.
PSA 29:7 Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe mgbe amụma na-egbu.
PSA 29:8 Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji; Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji.
PSA 29:9 Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa. Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!”
PSA 29:10 Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri; Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 29:11 Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike, ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya.
PSA 30:1 Abụ Ọma. Abụ nke ido obieze Devid nsọ. Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị.
PSA 30:2 O Onyenwe anyị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka, ị gwọkwara m.
PSA 30:3 O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ.
PSA 30:4 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya.
PSA 30:5 Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.
PSA 30:6 Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m, “Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.”
PSA 30:7 O Onyenwe anyị, mgbe i gosiri m ihuọma, i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu; ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ, adara m mba.
PSA 30:8 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, ka m kpọkuru; ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị,
PSA 30:9 “Uru gịnị dị ma m laa nʼiyi? Uru gịnị dị ma m rịda nʼili? Uzuzu aja ọ ga-enye gị otuto? Ọ ga-ekwusa banyere ikwesi ntụkwasị obi gị?”
PSA 30:10 O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere; O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka.
PSA 30:11 I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme.
PSA 30:12 I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 31:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m; site nʼezi omume gị gbapụta m.
PSA 31:2 Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m, bịa ngwangwa gbapụta m; ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m.
PSA 31:3 Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike, nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m.
PSA 31:4 Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m, nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike.
PSA 31:5 Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m; gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu.
PSA 31:6 Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru; ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi m.
PSA 31:7 Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị, nʼihi na ị hụrụ nsogbu m marakwa ihe mgbu nke mmụọ m.
PSA 31:8 I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m, kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ.
PSA 31:9 O Onyenwe anyị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m. Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa; ike adịghịkwa m.
PSA 31:10 Iru ụjụ eriela m ahụ; ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m; ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa m ruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m.
PSA 31:11 Nʼihi ndị iro m niile; ndị agbataobi m na-elelị m anya. Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m, ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee.
PSA 31:12 Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ. A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m.
PSA 31:13 Anụla m nkwulu ha megide m; oke egwu dị nʼakụkụ niile; ha na-agba izu megide m, na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m.
PSA 31:14 Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị. Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.”
PSA 31:15 Oge m niile dị gị nʼaka. Napụta m nʼaka ndị iro m na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ.
PSA 31:16 Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ; zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ.
PSA 31:17 O Onyenwe anyị, ekwela ka ihere mee m, nʼihi na akpọkuola m gị; kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ, ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu.
PSA 31:18 Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam; nʼihi na ọ bụ site na mpako na nlelị ka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume.
PSA 31:19 Lee ka ịdị mma gị si baa ụba, nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị, nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị, nʼihu ọha mmadụ.
PSA 31:20 I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ; ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị; ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche.
PSA 31:21 Otuto dịrị Onyenwe anyị nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu.
PSA 31:22 Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị, “Ewezugala m site nʼihu ya!” Ma ị nụrụ arịrịọ m maka ebere mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka.
PSA 31:23 Hụnụ Onyenwe anyị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi, nʼihi na Onyenwe anyị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya, ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu.
PSA 31:24 Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike, unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.
PSA 32:1 Abụ Ọma Devid. Abụ Maskil. Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye a gbaghaara ajọ omume ya niile, onye e kpuchikwaara mmehie ya niile.
PSA 32:2 Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya, onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya.
PSA 32:3 Mgbe m gbachiri nkịtị, ọkpụkpụ m rere ure site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile.
PSA 32:4 Ehihie niile na abalị niile, ị tara m ahụhụ, ume dị m nʼobi gwụchara, dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị. Sela
PSA 32:5 Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị, kwụsịkwa izo ha ezo. Agwara m onwe m okwu sị, “Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.” Ị gbaghakwaara m ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela
PSA 32:6 Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere mgbe e nwere ike ịchọta gị; nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa, ọ gaghị erute ha.
PSA 32:7 Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo; Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso. Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela
PSA 32:8 Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso; Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.
PSA 32:9 Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu nke na-enweghị akọnuche, nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya, ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị.
PSA 32:10 Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ, na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu.
PSA 32:11 Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume; bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi.
PSA 33:1 Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume; nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya.
PSA 33:2 Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu.
PSA 33:3 Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ; were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ.
PSA 33:4 Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile.
PSA 33:5 Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ.
PSA 33:6 Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile, jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile.
PSA 33:7 Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe, kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu.
PSA 33:8 Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu; ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya.
PSA 33:9 Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara; o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm.
PSA 33:10 Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile; ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ.
PSA 33:11 Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ebumnobi ya ruo ọgbọ niile.
PSA 33:12 Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha; bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya.
PSA 33:13 Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya. Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya.
PSA 33:14 O sitere nʼebe obibi ya na-ele onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya.
PSA 33:15 Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu; ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme.
PSA 33:16 Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya; o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya.
PSA 33:17 Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha. Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.
PSA 33:18 Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche, ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ.
PSA 33:19 Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.
PSA 33:20 Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị; ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị.
PSA 33:21 Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya; nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi.
PSA 33:22 O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị, dịka olileanya anyị dị na gị.
PSA 34:1 Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.
PSA 34:2 Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ.
PSA 34:3 Soro m too Onyenwe anyị; ka anyị bulie aha ya elu.
PSA 34:4 Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile.
PSA 34:5 Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha.
PSA 34:6 Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile.
PSA 34:7 Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha.
PSA 34:8 Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.
PSA 34:9 Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya.
PSA 34:10 Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.
PSA 34:11 Ụmụ m, bịanụ gee m ntị; aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ.
PSA 34:12 Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya, ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,
PSA 34:13 chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha.
PSA 34:14 Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe, chọọ udo ma gbasookwa ya.
PSA 34:15 Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha;
PSA 34:16 ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa.
PSA 34:17 Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.
PSA 34:18 Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
PSA 34:19 Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.
PSA 34:20 Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie.
PSA 34:21 Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ; ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ.
PSA 34:22 Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.
PSA 35:1 Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ; buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha.
PSA 35:2 Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị; bilie bịa nyere m aka.
PSA 35:3 Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị; bịa zute ndị na-achụ m ọsọ. Gwa mkpụrụobi m, “Abụ m nzọpụta gị.”
PSA 35:4 Mee ka ihere mee ndị niile na-agbalịsị ike igbu m. Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ, na ndị ihere mere.
PSA 35:5 Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe, ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụfu ha.
PSA 35:6 Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị; ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụ ha ọsọ.
PSA 35:7 Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha, ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m.
PSA 35:8 Ka mbibi bịakwasị ha na mberede, ka ụgbụ ha zobeere m kee ha; ka ha lakwaa nʼiyi site nʼidaba nʼolulu ahụ ha gwuru.
PSA 35:9 Mgbe ahụ, mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ na Onyenwe anyị, ọ ga-enwekwa obi ụtọ nʼime nzọpụta ya.
PSA 35:10 Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị, “O Onyenwe anyị, ọ bụ onye dịka gị? Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha, ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.”
PSA 35:11 Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m; ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ.
PSA 35:12 Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ. Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ.
PSA 35:13 Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe, site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala. Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa,
PSA 35:14 ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m, jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ.
PSA 35:15 Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ; mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m. Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka.
PSA 35:16 Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe, na-atakwara m ikikere eze ha.
PSA 35:17 O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme? Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile, site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa.
PSA 35:18 Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu, nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị.
PSA 35:19 Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m, mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị; ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro, mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike.
PSA 35:20 Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu, kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ.
PSA 35:21 Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị, “Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.”
PSA 35:22 O Onyenwe anyị, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị; anọkwala m nʼebe dị anya, O Onyenwe anyị.
PSA 35:23 Teta, bilie bụụrụ m onye mkpepụta m. Kpechitere m ọnụ m, Chineke m na onyenwe m.
PSA 35:24 O Onyenwe anyị Chineke m, kpepụta m nʼihi ezi omume gị; ekwekwala ka ha chịa m ọchị.
PSA 35:25 Ekwekwala ka ha sị, “Ahaa, ọ dị ka anyị tụrụ anya ya!” Maọbụ sị, “Anyị eloola ya!”
PSA 35:26 Mee ka ihere na ọgbaaghara bụrụ nke ndị na-achị m ọchị nʼime mkpagbu m; were ihere na nweda nʼala yinye ha dịka uwe, bụ ndị niile na-ebuli onwe ha elu imegide m.
PSA 35:27 Ka ndị niile mkpepụta m dị mma were obi ụtọ tie mkpu ọṅụ; ka ha na-asị mgbe niile, “Ka e bulie Onyenwe anyị elu, onye ọdịmma nke ohu ya na-amasị.”
PSA 35:28 Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gị na otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.
PSA 36:1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid, bụ ohu Onyenwe anyị. E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe: Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke dị nʼanya ha.
PSA 36:2 Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha, na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị.
PSA 36:3 Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ; ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma.
PSA 36:4 Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe; ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume, ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi.
PSA 36:5 O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe, ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe.
PSA 36:6 Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu, ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri. O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ.
PSA 36:7 Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke! Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.
PSA 36:8 Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị; Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị.
PSA 36:9 Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị; ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.
PSA 36:10 Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị, ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi.
PSA 36:11 Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi, ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo.
PSA 36:12 Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala, a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.
PSA 37:1 Abụ Ọma Devid. Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ, maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo;
PSA 37:2 nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa, dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa.
PSA 37:3 Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.
PSA 37:4 Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.
PSA 37:5 Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:
PSA 37:6 Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie.
PSA 37:7 Dere duu nʼihu Onyenwe anyị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.
PSA 37:8 Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ.
PSA 37:9 Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.
PSA 37:10 Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga; ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha.
PSA 37:11 Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha, ha ga-enwekwa udo dị ukwuu.
PSA 37:12 Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume, na-ata ikekere eze megide ha;
PSA 37:13 ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị, nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa.
PSA 37:14 Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha, kwee ụta ha ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa, igbu ndị ụzọ ha ziri ezi.
PSA 37:15 Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha, kụrisiekwa ụta ha.
PSA 37:16 Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume;
PSA 37:17 nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume, ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume.
PSA 37:18 Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị, ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 37:19 Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ; ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ.
PSA 37:20 Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi. Nʼagbanyeghị na ndị iro Onyenwe anyị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ, ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ.
PSA 37:21 Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya, ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere.
PSA 37:22 Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa, ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ.
PSA 37:23 Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;
PSA 37:24 ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya.
PSA 37:25 Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.
PSA 37:26 Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe, ụmụ ha ga-abụ ngọzị.
PSA 37:27 Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 37:28 Onyenwe anyị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya. Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi, ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ;
PSA 37:29 ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha, ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 37:30 Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta, ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi.
PSA 37:31 Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.
PSA 37:32 Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo, na-achọ ịnapụ ha ndụ ha;
PSA 37:33 ma Onyenwe anyị agaghị ahapụ ha nʼaka ha, ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe.
PSA 37:34 Chere Onyenwe anyị, debekwa ụzọ ya. Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa; mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya.
PSA 37:35 Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike, ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala,
PSA 37:36 ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ, nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya.
PSA 37:37 Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama; ọganihu dịịrị onye udo.
PSA 37:38 Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi; ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume.
PSA 37:39 Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa; ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.
PSA 37:40 Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume, nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.
PSA 38:1 Abụ Ọma Devid. Arịrịọ. Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe, maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ.
PSA 38:2 Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ, aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ.
PSA 38:3 Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ; enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m.
PSA 38:4 Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m.
PSA 38:5 Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi nʼihi mmehie enweghị uche m.
PSA 38:6 Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ.
PSA 38:7 Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu ahụ adịghịkwa m.
PSA 38:8 Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa. Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi.
PSA 38:9 O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m; ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ.
PSA 38:10 Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m, ìhè esitekwala nʼanya m pụọ.
PSA 38:11 Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m, ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya.
PSA 38:12 Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya, ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m; ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ.
PSA 38:13 Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla, dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya.
PSA 38:14 Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe, onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu.
PSA 38:15 O Onyenwe anyị, ana m eche gị; o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.
PSA 38:16 Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m; maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.”
PSA 38:17 Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada. Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.
PSA 38:18 Ana m ekwupụta mmehie m; mmehie m na-ewute m.
PSA 38:19 Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ, ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba.
PSA 38:20 Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe, na-ebo ebubo megide m nʼagbanyeghị na m na-achọ ime naanị ezi ihe.
PSA 38:21 O Onyenwe anyị, ahapụkwala m; O Chineke m, anọkwala m ebe dị anya.
PSA 38:22 Bịa ọsịịsọ inyere m aka Onyenwe m na Onye nzọpụta m.
PSA 39:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ maka Jedutun. Abụ Ọma Devid. Asịrị m, “Aga m elezi anya nʼụzọ m niile ma debe ire m ka m ghara ikwuhie; aga m eji ihe kechie ọnụ m mgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume.”
PSA 39:2 Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu, jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma, oke ihe mgbu m mụbara.
PSA 39:3 Obi m kporo ọkụ nʼime m, ma mgbe m na-atụgharị ihe ndị a nʼuche, ọkụ ahụ nọ na-ere; mgbe ahụ ekwuru m okwu sị:
PSA 39:4 “O Onyenwe anyị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile; mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa.
PSA 39:5 I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta; ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị. Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume ọbụladị ndị dịka ha guzosirike. Sela
PSA 39:6 “Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ, na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ.
PSA 39:7 “Ma ugbu a, Onyenwe m, gịnị ka m na-ele anya ya? Olileanya m dị nʼime gị.
PSA 39:8 Zọpụta m site na mmehie m niile; ekwela ka m bụrụ ihe ọchị nye ndị nzuzu.
PSA 39:9 Agbachiri m nkịtị, ajụrụ m ikwu okwu, nʼihi na ọ bụ gị mere ihe a.
PSA 39:10 Kwụsị iti m ihe; ihe otiti nke aka gị ezuola m ahụ.
PSA 39:11 Ị na-abara ndị mmadụ mba ma na-ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha; ị na-eripịa akụnụba ha dịka nla, mmadụ ọbụla bụ naanị otu nkuume. Sela
PSA 39:12 “O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa m maka enyemaka; emechila ntị gị nye ibe akwa m. Nʼihi ana m ebinyere gị dịka onye ọbịa, dịka onye ije, dịka nna nna m ha mere.
PSA 39:13 Lepụ anya na-ebe m nọ, ka m nwee ike kporie ndụ ọzọ, tupu m hapụ ebe a laa, a gaghị ahụkwa m ọzọ.”
PSA 40:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Eji m ndidi chere Onyenwe anyị, ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m.
PSA 40:2 O sitere nʼolulu na-amị amị, nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m; o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume, nyekwa m ebe siri ike ka m guzo.
PSA 40:3 O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m, abụ otuto nye Chineke anyị. Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu, ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị.
PSA 40:4 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya; onye na-adịghị ele ndị mpako anya maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.
PSA 40:5 O Onyenwe anyị Chineke m, ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ, ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile ị kwadooro maka inye anyị; a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha, ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu.
PSA 40:6 Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ.
PSA 40:7 Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.
PSA 40:8 O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, iwu gị dị nʼime obi m.”
PSA 40:9 Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi; dịka ị maara, o Onyenwe anyị, anaghị m emechi ọnụ m.
PSA 40:10 Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m, ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị. Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị, nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.
PSA 40:11 O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị, ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile.
PSA 40:12 Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu; mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ: ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi, obi m na-adakwa mba nʼime m.
PSA 40:13 O Onyenwe anyị, ya masị gị ịzọpụta m; O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.
PSA 40:14 Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara; ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m, laghachi azụ nʼihere.
PSA 40:15 Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” kụja nʼihi ihere onwe ha.
PSA 40:16 Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị; ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.”
PSA 40:17 Ma mụ onwe m bụ m ogbenye na onye nọ na mkpa; ka Onyenwe anyị cheta m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; Ị bụ Chineke m, anọla ọdụ ịbịa.
PSA 41:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ ndị nwere uche na-eleta ndị ogbenye; Onyenwe anyị na-azọpụta ha nʼoge nsogbu.
PSA 41:2 Onyenwe anyị ga-echebe ha, debekwa ha ndụ; ọ ga-eme ka ihe na-agara ha nke ọma nʼala ahụ, ọ gaghị arara ha nye nʼọchịchọ ndị iro ha.
PSA 41:3 Onyenwe anyị na-elekọta ha mgbe ahụ na-esighị ha ike, meekwa ka ahụ dị ha mma.
PSA 41:4 Ekwuru m sị, “O Onyenwe anyị, meere m ebere; gwọọ m, nʼihi na emehiela m megide gị.”
PSA 41:5 Ndị iro m na-esite nʼiro ha ekwu okwu megide m na-asị, “Olee mgbe ọ ga-anwụ ka aha ya laa nʼiyi?”
PSA 41:6 Mgbe otu nʼime ha bịara ịhụ m, ọ na-ekwu okwu ụgha, ma obi ya na-achịkọta ihe nkwulu; mgbe ahụ ọ na-apụ, ga kọsaa ya.
PSA 41:7 Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m; ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha:
PSA 41:8 “Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya; ọ gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ.”
PSA 41:9 Ọ bụladị ezigbo enyi m, onye m tụkwasịrị obi, onye mụ na ya na-eso erikọ nri m, ebiliela imegide m.
PSA 41:10 Ma gị, O Onyenwe anyị, meere m ebere, mee ka ahụ sie m ike ọzọ, ka m nwee ike kwụghachi ha ụgwọ.
PSA 41:11 Amaara m na ihe banyere m na-atọ gị ụtọ nʼobi, nʼihi na i kwebeghị ka ndị iro m nwee mmeri nʼebe m nọ.
PSA 41:12 Nʼihi ikwesi ntụkwasị obi m, ị na-akwagide m, mee ka m nọrọ nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 41:13 Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
PSA 42:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Maskil nke ụmụ Kora. Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele, otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke.
PSA 42:2 Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke?
PSA 42:3 Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri nʼehihie ma nʼabalị, mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile, “Olee ebe Chineke gị nọ?”
PSA 42:4 Ihe ndị a ka m na-echeta mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m: ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga, mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi, na-aga nʼụlọ Chineke.
PSA 42:5 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya, Onye nzọpụta m na Chineke m.
PSA 42:6 Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m; ya mere, aga m echeta gị site nʼala Jọdan, na ebe dị elu nke Hemon, na sitekwa nʼugwu Miza.
PSA 42:7 Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile; ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile ekpuchiela isi m.
PSA 42:8 Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya, nʼabalị abụ ya dị m nʼobi, ekpere nye Chineke nke ndụ m.
PSA 42:9 Ana m asị Chineke, oke nkume m, “Gịnị mere i ji chefuo m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ nʼihi mmegbu nke onye iro?”
PSA 42:10 Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu, mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị, ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m, “Olee ebe Chineke gị nọ?”
PSA 42:11 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, Onye nzọpụta m na Chineke m.
PSA 43:1 O Chineke, kpepụta m, kpechitere m ikpe m nʼebe mba na-amaghị Chineke nọ; gbapụta m site nʼaka ndị ajọ omume na ndị aghụghọ.
PSA 43:2 Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike. Gịnị mere i ji jụ m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ, nʼihi mmegbu nke onye iro?
PSA 43:3 Zipụ ìhè gị na eziokwu gị, ka ha duo m; ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị, bụ ebe i bi.
PSA 43:4 Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke, gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m. Aga m eji ụbọ akwara too gị, O Chineke, bụ Chineke m.
PSA 43:5 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, onye Nzọpụta m na Chineke m.
PSA 44:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil nke ụmụ Kora. O Chineke, anyị anụla; nna anyị ha agwakwala anyị ihe ndị i mere nʼoge ha, nʼoge gara aga.
PSA 44:2 I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ, ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi. I gwepịara ndị ahụ ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa.
PSA 44:3 Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a, ha emerighị site nʼike nke aka ha; ọ bụ aka nri gị, aka gị, na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya.
PSA 44:4 Ị bụ eze m na Chineke m, onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri.
PSA 44:5 Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị, ka anyị ji zọda ndị iro anyị nʼokpuru ụkwụ anyị.
PSA 44:6 Atụkwasịghị m obi m nʼụta m, mma agha m anaghị enye m mmeri;
PSA 44:7 ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ, ị na-eme ka ihere mee ndị na-eguzogide anyị.
PSA 44:8 Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile, anyị ga-eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi. Sela
PSA 44:9 Ma ugbu a, ị jụla anyị ma weda anyị nʼala; ị naghị esokwa ndị agha anyị apụ ọzọ.
PSA 44:10 I mere ka anyị site nʼihu ndị iro anyị gbalaga, i meela ka ndị na-emegide anyị were aka ike napụ anyị ihe bụ nke anyị.
PSA 44:11 Ị gbakụtara anyị azụ ka e ripịa anyị dịka atụrụ, ma chụsasịa anyị nʼetiti mba niile.
PSA 44:12 I rere ndị gị ọnụ ala, ihe i retara ha abaghị uru nye gị.
PSA 44:13 I meela ka anyị bụrụ nkọcha nye ndị agbataobi anyị, anyị bụ ihe ịkwa emo na ihe ọchị nye ndị gbara anyị gburugburu.
PSA 44:14 I meela anyị ka anyị bụrụ ihe ịmaatụ ọchị nʼetiti mba niile, ndị ọbụla hụrụ anyị na-efufe isi na mkparị.
PSA 44:15 Ogologo ụbọchị niile, ihere m dị m nʼihu, ihere m na-ekpuchikwa m ihu,
PSA 44:16 mgbe ndị nkwulu na ndị nkọcha na-eji m eme ihe ọchị, nʼihi onye iro, onye kpebiri ịbọ ọbọ.
PSA 44:17 Ọ bụ ezie na ihe ndị a adakwasịla anyị, ma anyị echefubeghị gị. Anyị enupubeghị isi nʼọgbụgba ndụ anyị na gị.
PSA 44:18 Obi anyị ahapụbeghị gị! Anyị ahapụbekwaghị iso ụzọ gị.
PSA 44:19 Ma i gwepịara anyị mee ka anyị bụrụ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị, jirikwa oke ọchịchịrị kpuchie anyị.
PSA 44:20 Ọ bụrụ na anyị chefuru aha Chineke anyị, maọbụ na anyị gbasaara chi mba ọzọ aka anyị,
PSA 44:21 ọ bụ na Chineke agaraghị achọpụta ya, ebe ọ maara ihe nzuzo niile dị nʼobi?
PSA 44:22 Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji agba mgba, ogologo ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.
PSA 44:23 O, Onyenwe m teta! Gịnị mere i ji arahụ ụra? Kpọtee onwe gị! Ajụkwala anyị ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 44:24 Gịnị mere i ji ezopụ ihu gị, ma chefuo mmegbu na ịta ahụhụ anyị?
PSA 44:25 E tidala anyị nʼala, nʼuzuzu, ahụ anyị rapara nʼaja
PSA 44:26 Bilie ma nyere anyị aka; gbapụta anyị maka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ.
PSA 45:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Okoko osisi lili.” Abụ maskil ụmụ Kora. Abụ maka agbamakwụkwọ. Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m, mgbe m na-agụgharị abụ m nye eze; ire m bụ mkpisi akwụkwọ dị nʼaka ọka ode akwụkwọ.
PSA 45:2 I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ, e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ, ebe ọ bụ na Chineke agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 45:3 Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike; yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe.
PSA 45:4 Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri, nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume; ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya.
PSA 45:5 Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze; ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị.
PSA 45:6 O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ
PSA 45:7 Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị; ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị, site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.
PSA 45:8 Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ máá na aloos na akashia; ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma. Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ.
PSA 45:9 Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ; nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị.
PSA 45:10 Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu: “Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị.
PSA 45:11 Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike. Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.”
PSA 45:12 Ada Taịa ga-eji onyinye bịa; ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma.
PSA 45:13 Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya; ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya.
PSA 45:14 Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị; ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi mgbe e dubatara ya nʼụlọeze.
PSA 45:15 E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha; ha bara nʼime ụlọeze.
PSA 45:16 Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị; ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile.
PSA 45:17 Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile; nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.
PSA 46:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Nʼusoro olu abụ alamot. Otu Abụ. Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị, onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu.
PSA 46:2 Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi, maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.
PSA 46:3 Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ, maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela
PSA 46:4 Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke, nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu.
PSA 46:5 Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada; Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.
PSA 46:6 Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa; o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze.
PSA 46:7 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela
PSA 46:8 Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere, lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa.
PSA 46:9 Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo nsọtụ nke elu ụwa niile. Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe, ma na-esu ọta agha niile ọkụ.
PSA 46:10 Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke! A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile, a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.”
PSA 46:11 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela
PSA 47:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. Kụọnụ aka unu, unu mba niile; jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke.
PSA 47:2 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu. Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile.
PSA 47:3 O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị; ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị.
PSA 47:4 Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị, ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. Sela
PSA 47:5 Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo.
PSA 47:6 Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.
PSA 47:7 Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile. Jirinụ abụ too ya.
PSA 47:8 Chineke bụ eze mba niile; ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.
PSA 47:9 Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala, dịka ndị Chineke nke Ebraham, nʼihi na ndị eze niile dị nʼụwa bụ nke Chineke; ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.
PSA 48:1 Otu Abụ. Abụ Ọma nke ụmụ Kora. Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto, nʼime obodo Chineke anyị, nʼugwu nsọ ya.
PSA 48:2 Ọ mara mma nʼịdị elu ya, bụkwa ọṅụ elu ụwa niile. Ugwu Zayọn, obodo eze ahụ dị ukwuu, dịka ebe kachasị elu nke Zafọn.
PSA 48:3 Chineke nọ nʼime ebe ya e wusiri ike; o gosila onwe ya dịka ebe mgbaba ha e wusiri ike.
PSA 48:4 Mgbe ndị eze jikọtara ndị agha ha ọnụ, mgbe ha bịakọtara nso,
PSA 48:5 ihe ha hụrụ juru ha anya; nʼihi oke egwu, ha gbara ọsọ.
PSA 48:6 Ahụ ọma jijiji bidoro ha nʼebe ahụ, ihe mgbu ha dịka nke nwanyị na-achọ ịmụ nwa.
PSA 48:7 Ị lara ha nʼiyi dịka oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ si ala ụgbọ mmiri ukwuu nke Tashish nʼiyi.
PSA 48:8 Dịka anyị nụrụ, otu a ka anyị hụrụ, nʼime obodo Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nʼime obodo Chineke anyị: Chineke na-eme ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Sela
PSA 48:9 O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị, ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ.
PSA 48:10 O Chineke, dịka aha gị, otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile; aka nri gị jupụtara nʼezi omume.
PSA 48:11 Ugwu Zayọn na-aṅụrị ọṅụ, obodo nta niile nke Juda nwere obi ụtọ nʼihi ikpe gị niile.
PSA 48:12 Gaanụ Zayọn gburugburu, Jegharịa ya gburugburu, gụọkwanụ ụlọ elu ya niile ọnụ.
PSA 48:13 Lezienụ mgbidi ya niile anya, nyochakwaanụ ebe ya niile e wusiri ike, ka unu nwee ike ịkọrọ ọgbọ na-abịa nʼihu akụkọ ndị a.
PSA 48:14 Nʼihi na Chineke a, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi, ọ ga-abụ onyendu anyị, ọ bụladị ruo nʼọgwụgwụ.
PSA 49:1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. Nụrụnụ nke a, unu mmadụ niile! Geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼụwa,
PSA 49:2 ma ndị dị ala ma ndị dị elu, ma onye ọgaranya ma onye ogbenye.
PSA 49:3 Aga m ekwu okwu amamihe, ihe sị nʼobi m ga-enye nghọta.
PSA 49:4 Aga m aṅa ntị nye ilu, aga m e ji ụbọ akwara kọwaa ilu m.
PSA 49:5 Nʼihi gịnị ka m ga-eji tụọ egwu mgbe ụbọchị ọjọọ bịara, mgbe ndị aghụghọ ọjọọ gbara m gburugburu,
PSA 49:6 ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba ha ma na-anyakwa isi nʼihi oke ụba ha.
PSA 49:7 O nweghị onye pụrụ ịgbapụta ndụ onye ọzọ, maọbụ nye Chineke ụgwọ e ji agbara onye ahụ,
PSA 49:8 nʼihi na ụgwọ e ji agbara ndụ dị oke ọnụ, o nweghị ụgwọ a ga-akwụ nke ga-ezu,
PSA 49:9 nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ruo ebighị ebi, ma hapụ ịnwụ.
PSA 49:10 Nʼihi na mmadụ niile na-ahụ na ndị amamihe na-anwụ, ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche na-anwụkwa, si otu a hapụrụ ndị ọzọ akụnụba ha.
PSA 49:11 Ili ha na-aghọ ụlọ ha ruo ebighị ebi, ebe obibi ha ruo ọgbọ niile nʼagbanyeghị na ha gụrụ ọtụtụ ala aha ha.
PSA 49:12 Ma mmadụ, nʼagbanyeghị akụnụba ya, aghaghị ịnwụ, dịka anụ ọhịa, ọ ga-anwụkwa.
PSA 49:13 Nke a bụ ihe na-adakwasị ndị na-atụkwasị obi nʼonwe ha, na ndị na-eso ụzọ ha, ndị na-akwado okwu ha. Sela
PSA 49:14 Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha, ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ, ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ. Ozu ha ga-erekasị nʼime ili nʼebe dị anya site nʼụlọeze ha.
PSA 49:15 Ma Chineke ga-agbapụta ndụ m site nʼili, nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya. Sela
PSA 49:16 Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba, mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba,
PSA 49:17 nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ, ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili.
PSA 49:18 Nʼagbanyeghị na ọ gụrụ onwe ya dịka onye a gọziri agọzi mgbe ọ dị ndụ, ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eto gị mgbe ị na-enwe ọganihu,
PSA 49:19 ọ ga-eso ọgbọ ndị nna nna ya ndị na-agaghị ahụkwa ìhè ọzọ.
PSA 49:20 Ndị bara ụba nke na-enweghị nghọta dịka anụ ọhịa nke ga-ala nʼiyi.
PSA 50:1 Abụ Ọma Asaf. Onyenwe anyị, Chineke, Onye kachasị chi niile, ekwuola okwu ma kpọkọta ụwa niile, site na ọwụwa anyanwụ ruo na ọdịda ya.
PSA 50:2 Chineke na-enwupụta dịka ìhè, site na Zayọn, nke zuruoke nʼime ịma mma.
PSA 50:3 Chineke anyị na-abịa, ọ gaghị emechikwa ọnụ; ọkụ na-erepịa erepịa dị nʼihu ya, oke ifufe na-efesi ike gbakwara ya gburugburu.
PSA 50:4 Ọ na-akpọku eluigwe na ụwa ka o kpee ndị ya ikpe: Ọ na-asị,
PSA 50:5 “Chikọtaranụ m ndị m e doro nsọ, bụ ndị mụ na ha ji ịchụ aja gbaa ndụ.”
PSA 50:6 Eluigwe na-ekwupụta ezi omume ya, nʼihi na Chineke nʼonwe ya bụ onye ikpe. Sela
PSA 50:7 “Nụrụnụ, ndị m, m ga-ekwukwa, Izrel, aga m agba ama megide unu, Abụ m Chineke, Chineke unu.
PSA 50:8 Anaghị m abara unu mba nʼihi ịchụ aja unu, na aja nsure ọkụ unu nke na-adị m nʼihu oge niile.
PSA 50:9 Enweghị m mkpa maka oke ehi unu site nʼụlọ anụmanụ unu maọbụ mkpi site nʼọgba igwe ewu na atụrụ unu,
PSA 50:10 nʼihi na ụmụ anụmanụ niile nke oke ọhịa bụ nke m, ha na ehi niile nọ nʼelu otu puku ugwu.
PSA 50:11 Amaara m ụmụ nnụnụ niile nọ nʼelu ugwu niile, ihe niile e kere eke nọ nʼọhịa bụ nke m.
PSA 50:12 Ọ bụrụ na agụụ agụọ m, agaghị m agwa gị ya, nʼihi na ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke m.
PSA 50:13 Ana m ata anụ oke ehi, ka ọ bụ ọbara mkpi ka m ga-aṅụ?
PSA 50:14 “Chụọrọ Chineke aja ekele, mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu,
PSA 50:15 ma kpọkuo m nʼụbọchị nsogbu gị, aga m agbapụta unu, unu ga-enyekwa m nsọpụrụ.”
PSA 50:16 Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị, “Olee, nkwuwa okwu unu nwere ịgụgharị iwu m, maọbụ kwupụta ọgbụgba ndụ m nʼọnụ unu?
PSA 50:17 Unu kpọrọ ndụmọdụ m asị, na-atụfekwa okwu m nʼazụ unu.
PSA 50:18 Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka; unu na ndị na-akwa iko na-ekekọkwa oke.
PSA 50:19 Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ, okwu aghụghọ na nke rere ure na-esikwa nʼọnụ unu na-asọpụta dịka iyi.
PSA 50:20 Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile, na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke.
PSA 50:21 Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị; unu chekwara na adị m ka unu. Ma aga m abara unu mba ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu.
PSA 50:22 “Tụgharịa uche na nke a, unu ndị na-echefu Chineke, ma ọ bụghị ya, aga m adọrisi unu, ọ dịkwaghị onye ga-agbapụta unu.
PSA 50:23 Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m, ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya, ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”
PSA 51:1 Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile.
PSA 51:2 Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha.
PSA 51:3 Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.
PSA 51:4 Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.
PSA 51:5 Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.
PSA 51:6 Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo; ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo.
PSA 51:7 Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.
PSA 51:8 Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.
PSA 51:9 Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, hichapụkwa mmehie m niile.
PSA 51:10 Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
PSA 51:11 Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.
PSA 51:12 Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m.
PSA 51:13 Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị.
PSA 51:14 O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị.
PSA 51:15 O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị.
PSA 51:16 Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.
PSA 51:17 Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.
PSA 51:18 Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu; i wulie mgbidi niile nke Jerusalem.
PSA 51:19 Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja, aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ; mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.
PSA 52:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil Devid. Nke o bụrụ mgbe Doeg onye Edọm gara gwa Sọl sị, “Devid gara hụ Ahimelek nʼụlọ ya.” Gịnị mere i ji na-anya isi nʼihe ọjọọ, gị nwoke dị ike? Gịnị mere na ogologo ụbọchị niile, ị na-anya isi, gị onye Chineke na-eleda anya?
PSA 52:2 Ire gị na-atụ atụmatụ ịla nʼiyi; ọ dị ka agụba dị nkọ, gị onye na-ebi ndụ aghụghọ.
PSA 52:3 Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma, ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. Sela
PSA 52:4 O onye ire aghụghọ! Ị hụrụ okwu ọbụla nke na-emegide mmadụ nʼanya.
PSA 52:5 Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị, ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. Sela
PSA 52:6 Ndị ezi omume ga-ahụ ya tụkwaa egwu; ha ga-achị ya ọchị na-asị,
PSA 52:7 “Ugbu a, lee nwoke ahụ, onye jụrụ ime Chineke ebe mgbaba ya. Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu. O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!”
PSA 52:8 Ma adị m ka osisi oliv, nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya Chineke, nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
PSA 52:9 Aga m eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi nʼihi ihe i mere; aga m eto gị nʼihu ndị gị dị nsọ. Olileanya m ga-adị nʼime aha gị, nʼihi na aha gị dị mma.
PSA 53:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Mahalat. Abụ maskil Devid. Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.
PSA 53:2 Chineke sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya, ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta, onye nke na-achọ Chineke.
PSA 53:3 Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị otu onye.
PSA 53:4 Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe? Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri, ha adịghị akpọkukwa Chineke.
PSA 53:5 Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu, ebe ọ dịghị ihe egwu na-adịghị. Chineke fesasịrị ọkpụkpụ ndị niile megidere gị; i mere ka ihere mee ha, nʼihi na Chineke ajụla ha.
PSA 53:6 O, a sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta! Mgbe Chineke ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha, ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!
PSA 54:1 Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, “Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?” O Chineke, jiri aha gị zọpụta m; jirikwa ike gị kpepụta m.
PSA 54:2 O Chineke, nụrụ ekpere m; gee ntị nʼokwu ọnụ m.
PSA 54:3 Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela
PSA 54:4 Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume.
PSA 54:5 Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m; nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi.
PSA 54:6 Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.
PSA 54:7 Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile, ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.
PSA 55:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. O Chineke, nụrụ ekpere m, agbakwala arịrịọ m nkịtị;
PSA 55:2 ṅaa m ntị, zaakwa m. Echiche m na-esogbu m; ana m asụkwa oke ude
PSA 55:3 nʼihi ihe onye iro m na-ekwu, nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ, na-akpagbu m nʼiwe ha.
PSA 55:4 Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m; oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m.
PSA 55:5 Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m; oke egwu ekpuchiela m.
PSA 55:6 Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru! Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike.
PSA 55:7 Agaara m efelaga ebe dị anya, ga nọrọ nʼọzara; Sela
PSA 55:8 Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m, ebe dị anya site nʼebe ifufe siri ike na oke ifufe dị.”
PSA 55:9 O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu, nʼihi na ana m ahụ ihe ike na ịlụ ọgụ nʼime obodo.
PSA 55:10 Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya; iro na mmegbu dị nʼime ya.
PSA 55:11 A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo; ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo.
PSA 55:12 A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị, apụrụ m ịnagide ya; a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m, apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ.
PSA 55:13 Maọbụ gị, nwoke dịka m, onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma,
PSA 55:14 onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ, nʼụlọ Chineke, ka anyị na-ejegharị nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe.
PSA 55:15 Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede; ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ, nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha.
PSA 55:16 Ma akpọkuru m Chineke, Onyenwe anyị na-azọpụtakwa m.
PSA 55:17 Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị, ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya ma ọ na-anụkwa olu m.
PSA 55:18 Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ, site nʼagha niile e busoro m, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m.
PSA 55:19 Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi, onye na-adịghị agbanwe, ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ, nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. Sela
PSA 55:20 Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya, ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ.
PSA 55:21 Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ ka bọta, ma ibu agha juru ya obi; okwu ya niile dị nro karịa mmanụ, ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha.
PSA 55:22 Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile, ọ ga-agba gị ume; ọ gaghị ekwe ka ewezuga onye ezi omume.
PSA 55:23 Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume nʼime olulu nke jupụtara nʼire ure; ndị ogbu mmadụ na ndị aghụghọ agaghị ebi ọ bụladị ọkara ndụ ha. Ma mụ onwe m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.
PSA 56:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Ọ bụ olu abụ “Nduru nọ nʼosisi Ook dị ebe dị anya.” Abụ nke Devid ka eji agụ ya. Abụ miktam. Mgbe ndị Filistia nọchibidoro ya nʼobodo Gat. O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ndị mmadụ ji ike na-achụso m; ogologo ụbọchị niile, ha na-ebu agha imegide m.
PSA 56:2 Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m; site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m.
PSA 56:3 Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.
PSA 56:4 Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya, nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m?
PSA 56:5 Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi; oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ.
PSA 56:6 Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha, ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile, dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m.
PSA 56:7 Nʼihi ajọ omume ha, ekwekwala ka ha gbapụ; o Chineke, nʼime iwe gị, wedaa mba ndị a niile dị iche iche nʼala.
PSA 56:8 Depụta akwa arịrị m; chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị. Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị?
PSA 56:9 Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka, ndị iro m ga-agbaghachi azụ. Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na Chineke nọnyeere m.
PSA 56:10 Nʼime Chineke, onye m na-eto okwu ya, nʼime Onyenwe anyị, onye m na-eto okwu ya,
PSA 56:11 nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?
PSA 56:12 O Chineke m, nʼisi m ka nkwa niile m kwere gị dị; aga m ewetara gị onyinye ekele m niile.
PSA 56:13 Nʼihi na ị zọpụtala m site nʼọnwụ, ma napụta ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ, ka m nwee ike jegharịa nʼihu Chineke, nʼìhè nke ndụ.
PSA 57:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala” Devid. Abụ miktam. Mgbe ọ gbapụrụ ga biri nʼime ọgba nkume nʼihi Sọl. Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba. Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa.
PSA 57:2 Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu, Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa.
PSA 57:3 Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; Sela Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya.
PSA 57:4 Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm; amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa, ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe, ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha.
PSA 57:5 O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
PSA 57:6 Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ, ihe mgbu nyịturu m. Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe, ma ha onwe ha adabala nʼime ya. Sela
PSA 57:7 Obi m dị njikere, o Chineke, obi m dị njikere sikwaa ike; aga m abụ abụ, kụkwaa egwu.
PSA 57:8 Teta nʼụra mkpụrụobi m! Teta, ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ.
PSA 57:9 O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.
PSA 57:10 Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
PSA 57:11 O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
PSA 58:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Devid. Abụ miktam. Unu ndị na-achị achị, O nweela oge unu na-ekwu ihe ziri ezi? O nweela oge unu na-ekpe ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ?
PSA 58:2 Mba, nʼime obi unu, unu na-echepụta mmegbu, aka unu na-emepụta ihe ike nʼelu ụwa.
PSA 58:3 Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu; site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha.
PSA 58:4 Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ, na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri,
PSA 58:5 nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya, nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị.
PSA 58:6 O Chineke, tijie eze niile dị ha nʼọnụ; o Onyenwe anyị, dọpụta eze ọdụm ndị a!
PSA 58:7 Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ; mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie.
PSA 58:8 Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya; dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ.
PSA 58:9 Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu, ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume.
PSA 58:10 Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ, mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume.
PSA 58:11 Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ekwu sị, “Nʼezie, a na-akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ; nʼezie, e nwere Chineke onye na-ekpe ụwa ikpe.”
PSA 59:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Devid. Abụ miktam nke eji olu abụ “E bibikwala,” abụ. Mgbe Sọl zipụrụ ndị ikom ka e chee ụlọ Devid nche nʼihi igbu ya. O Chineke, site nʼaka ndị iro m gbapụta m, chebe m site nʼaka ndị na-ebili imegide m.
PSA 59:2 Gbapụta m site nʼaka ndị na-eme ajọ ihe, zọpụtakwa m site nʼaka ndị ogbu mmadụ.
PSA 59:3 Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ! Ndị na-eme ihe ike na-agba izu megide m, o Onyenwe anyị, ma ọ bụghị nʼihi ihe m mere maọbụ mmehie m.
PSA 59:4 Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m. Bilie, bịa nyere m aka; lee ihe ọjọọ dakwasịrị m!
PSA 59:5 Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gị onye bụ Chineke nke Izrel, kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ; e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. Sela
PSA 59:6 Nʼanyasị, ha na-alaghachi, na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.
PSA 59:7 Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta, okwu si nʼọnụ ha na-agbụpụta dị nkọ dịka mma agha, ha na-asịkwa, “Onye pụrụ ịnụ ihe anyị na-ekwu?”
PSA 59:8 Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị; ị na-akwa mba ndị a niile emo.
PSA 59:9 O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike.
PSA 59:10 Chineke m, onye m tụkwasịrị obi. Chineke ga-ebutere m ụzọ mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị.
PSA 59:11 O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha, ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu. Were ike gị mee ka ha wagharịa, wedakwaa ha nʼala.
PSA 59:12 Ka e jide ha nʼime nganga ha, nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta, na nʼihi okwu ọnụ ha. Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha,
PSA 59:13 jiri iwe ọkụ repịa ha, repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ. Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa, na Chineke na-achị Jekọb.
PSA 59:14 Nʼanyasị ha na-alaghachi; na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta, mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.
PSA 59:15 Ha na-awagharị na-achọ nri, na-etikwa mkpu ma ọ bụrụ na afọ ejughị ha.
PSA 59:16 Ma aga m abụ abụ banyere ike gị, nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị; ị bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.
PSA 59:17 O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-adabere.
PSA 60:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ.” Abụ miktam nke Devid maka izi ihe. Mgbe ọ lụsoro Aram Naharaim na Aram Zoba ọgụ, nakwa mgbe Joab lọghachitara, tigbuo narị ndị Edọm iri nʼabụọ na Ndagwurugwu Nnu. O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike; i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị.
PSA 60:2 I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya; mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji.
PSA 60:3 I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike; i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.
PSA 60:4 Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela
PSA 60:5 Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
PSA 60:6 Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.
PSA 60:7 Gilead bụ nke m, otu a kwa, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.
PSA 60:8 Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm; nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
PSA 60:9 Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm?
PSA 60:10 Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
PSA 60:11 Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
PSA 60:12 Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
PSA 61:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid nke eji ụbọ akwara akpọ. Nụrụ akwa m, O Chineke, gee ntị nʼekpere m.
PSA 61:2 Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa, ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba; duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu.
PSA 61:3 Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m, na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.
PSA 61:4 Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi, ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. Sela
PSA 61:5 Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere; i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.
PSA 61:6 Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze, mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ.
PSA 61:7 Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi; zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya.
PSA 61:8 Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi. Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.
PSA 62:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ Ọma Devid. Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike. Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa.
PSA 62:2 Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m; ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.
PSA 62:3 Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a? Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya, ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo?
PSA 62:4 Ha ekpebiela isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya; okwu ụgha na-atọ ha ụtọ. Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi, ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. Sela
PSA 62:5 O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke; olileanya m na-esite na ya na-abịa.
PSA 62:6 Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m. Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.
PSA 62:7 Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke, Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m.
PSA 62:8 Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ; kwupụtaranụ ya obi unu, nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela
PSA 62:9 Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume, ndị ukwu bụ naanị ụgha; ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu; ha niile bụ naanị otu nkuume.
PSA 62:10 Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego, maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu; akụ unu nwere ike mụbaa, unu atụkwasịla ha obi.
PSA 62:11 Chineke ekwuola otu ihe, ihe abụọ ka m nụrụ: “Na gị, O Chineke, dị ike,
PSA 62:12 na gị, Onyenwe anyị, jupụtara nʼịhụnanya. Nʼezie, ị ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya si dị.”
PSA 63:1 Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda. O Chineke, ị bụ Chineke m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya.
PSA 63:2 Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị.
PSA 63:3 Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.
PSA 63:4 Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.
PSA 63:5 Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.
PSA 63:6 Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.
PSA 63:7 Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị.
PSA 63:8 Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ; aka nri gị na-ejigide m.
PSA 63:9 A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi; ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa.
PSA 63:10 A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi, ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa.
PSA 63:11 Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke; ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya, ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.
PSA 64:1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m. Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m.
PSA 64:2 Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ, site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe.
PSA 64:3 Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha, na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ.
PSA 64:4 Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo, na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu.
PSA 64:5 Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ, ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo, ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya?”
PSA 64:6 Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị, “Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!” Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ.
PSA 64:7 Ma Chineke ga-agba ha àkụ, na mberede ka a ga-etida ha.
PSA 64:8 Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha, mee ka ha laa nʼiyi; ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo.
PSA 64:9 Mmadụ niile ga-atụ egwu, ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke Chineke, ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere.
PSA 64:10 Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, ha ga-agbabakwa nʼime ya; ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya.
PSA 65:1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Otu Abụ. I kwesiri otuto, O Chineke, nʼime Zayọn; ọ bụ gị ka anyị ga-emezuru nkwa anyị,
PSA 65:2 O gị onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka mmadụ niile ga-abịakwute,
PSA 65:3 Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị, ị gbaghara anyị njehie anyị niile.
PSA 65:4 Ngọzị na-adịrị ndị ahụ ị họpụtara, ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị! E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị, mee ka afọ ju anyị.
PSA 65:5 O Chineke, Onye nzọpụta anyị, i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị, ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa, na osimiri niile dị ebe dị anya,
PSA 65:6 onye ji ike ya kpụọ ugwu niile, ebe i yikwasịrị onwe gị ike dịka ngwa agha,
PSA 65:7 onye mere ka ụda olu oke osimiri niile na ụda olu ebili mmiri, na ọgbaaghara mba niile deere duu.
PSA 65:8 Ụwa niile jupụtara nʼịtụnanya nʼihi ọrụ ebube gị niile, nʼebe chi na-abọ, ebe anyanwụ na-ada, ka ị na-akpọlite abụ ọṅụ.
PSA 65:9 Ị na-elekọta ala na-agba ya mmiri; ị na-eme ka ọ bụrụ ala dị mma. Isi iyi Chineke adịghị ata ata, nʼihi inye ndị mmadụ mkpụrụ ubi, nʼihi na ọ bụ otu a ka ị chọrọ ka ọ dịrị.
PSA 65:10 Ị na-eme ka mmiri jupụta nʼala a kọrọ akọ mee ka elu aja a kọrọ akọ dị larịị; ị na-eji mmiri ozuzo eme ka ọ dị nro, na-agọzikwa ihe ndị akụnyere na ya.
PSA 65:11 Ị na-eji owuwe ihe ubi bara ụba kpukwasị afọ ọbụla dịka okpueze, ụgbọ na-ebu ihe owuwe ubi na-ejubiga oke.
PSA 65:12 Ala ebe ahịhịa na-epu nʼọzara na-ejupụta nʼahịhịa ndụ, e yikwasịrị ugwu niile obi ụtọ dịka uwe.
PSA 65:13 E were igwe anụ ụlọ kpuchie nʼelu ala niile ebe ahịhịa dị ndụ puru, ọka kpuchikwara ndagwurugwu niile; ha na-eti mkpu ọṅụ na-abụkwa abụ.
PSA 66:1 Abụ dịrị onyeisi abụ. Otu Abụ. Abụ Ọma. Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!
PSA 66:2 Bụọ abụ banyere ebube aha ya; meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube!
PSA 66:3 Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.
PSA 66:4 Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị; ha na-abụku gị abụ otuto, ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” Sela
PSA 66:5 Bịa lee ihe Chineke mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!
PSA 66:6 O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ, ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee; bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya.
PSA 66:7 Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya, anya ya na-elekwa mba niile, ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. Sela
PSA 66:8 Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile, kwere ka a nụ ụda otuto ya;
PSA 66:9 O chebela ndụ anyị, ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ.
PSA 66:10 Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị; ị nụchara anyị dịka ọlaọcha.
PSA 66:11 Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ, ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị.
PSA 66:12 I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu; anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee. Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile.
PSA 66:13 Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị, imezu nkwa m kwere gị
PSA 66:14 nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo, ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m.
PSA 66:15 Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja, ya na aja onyinye nke ọtụtụ ebule; Aga m achụkwa aja onyinye nke ọtụtụ oke ehi na mkpi. Sela
PSA 66:16 Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke; ka m kọọrọ unu ihe o meere m.
PSA 66:17 Eji m ọnụ m kpọkuo ya; otuto ya dị m nʼire.
PSA 66:18 Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m, Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị;
PSA 66:19 ma Chineke gere ntị nʼezie, nụrụkwa olu arịrịọ m.
PSA 66:20 Otuto dịrị Chineke, onye na-ajụghị ekpere m maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!
PSA 67:1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma. Otu Abụ. Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Sela
PSA 67:2 Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile.
PSA 67:3 Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị.
PSA 67:4 Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela
PSA 67:5 Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị.
PSA 67:6 Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya, Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị.
PSA 67:7 Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.
PSA 68:1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Abụ Ọma. Otu Abụ. Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị; ka ndị iro ya site nʼihu ya gbalaga.
PSA 68:2 Dịka ikuku si achụsa anwụrụ ọkụ, sikwa otu a chụsaa ha. Dịka mmanụ na-ehi ụra si agbaze nʼọkụ, ka ndị na-eme ihe ọjọọ laa nʼiyi nʼihu Chineke.
PSA 68:3 Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ, ma ṅụrịa nʼihu Chineke; ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ.
PSA 68:4 Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto, toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya, Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
PSA 68:5 Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha, onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ.
PSA 68:6 Chineke na-eme ka ndị naanị ha nọ nwee ezinaụlọ, ọ na-eji ịbụ abụ dupụta ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma ndị nnupu isi ka ọ na-eme ka ha biri, nʼala kpọrọ nkụ.
PSA 68:7 Mgbe i buteere ndị gị ụzọ, O Chineke, mgbe i gabigara nʼala tọgbọrọ nʼefu, Sela
PSA 68:8 elu ụwa mara jijiji, eluigwe wụpụrụ mmiri ozuzo, nʼihu Chineke, Onye Saịnaị, nʼihu Chineke, Chineke nke Izrel.
PSA 68:9 I nyere mmiri ozuzo nʼebe ọ dị ukwuu, O Chineke, i tutere ihe nketa gị nke ike gwụrụ.
PSA 68:10 Ndị gị biri nʼime ya, site nʼoke akụnụba gị, O Chineke, ị rọpụtaara ndị ogbenye mkpa ha.
PSA 68:11 Onyenwe anyị kpọsara okwu ahụ, ọnụọgụgụ ndị inyom kwusara ya bụ igwe dị ọtụtụ;
PSA 68:12 ndị eze na ndị agha ha ji ọsọ gbalaa; ndị mmadụ kere ihe a dọtara nʼagha, nʼime ọmụma ụlọ ikwu.
PSA 68:13 Ọ bụladị mgbe ị na-arahụ ụra nʼetiti ọgba atụrụ, nku abụọ nke nduru m bụ ihe e ji ọlaọcha kpuchie, jirikwa ọlaedo nke na-enwuke kpuchie abụba ya.
PSA 68:14 Mgbe Onye pụrụ ime ihe niile chụsasịrị ndị eze bi nʼala a, ọ dị ka snoo dara nʼelu Zalmon.
PSA 68:15 Ugwu Bashan, ugwu mara mma nke ukwuu, ugwu Bashan, ugwu nwere nʼelu ya ọtụtụ ugwu dị iche iche.
PSA 68:16 Gị ugwu nwere ọtụtụ ugwu, gịnị mere i ji ele anya site nʼekworo nʼugwu Chineke họọrọ ị bụ ebe ọ ga-anọ chịa, ebe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-ebi, ruo ebighị ebi?
PSA 68:17 Ọnụọgụgụ ụgbọ agha Chineke dị iri puku kwụrụ puku, a pụghị ịgụta ha; ha dịkwa puku kwụrụ puku; Onyenwe anyị sitere Saịnaị bata nʼụlọnsọ ya.
PSA 68:18 Mgbe i rigoro gaa nʼelu, i duuru ndị a dọtara nʼagha; ị natara onyinye dị iche iche nʼaka ndị mmadụ, ọ bụladị nʼaka ndị na-enupu isi, ka gị, O Onyenwe anyị Chineke, biri nʼebe ahụ.
PSA 68:19 Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị, Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile. Sela
PSA 68:20 Chineke anyị bụ Chineke na-azọpụta; mgbapụta pụọ nʼọnwụ na-esite nʼaka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
PSA 68:21 Nʼezie, Chineke ga-egwepịa isi ndị iro ya niile, isi ndị niile na-aga nʼihu ibi ndụ mmehie.
PSA 68:22 Onyenwe anyị kwuru sị, “Aga m esite na Bashan kpọlata ha, aga m adọpụta ha site nʼebe omimi nke osimiri,
PSA 68:23 ka unu nwee ike saa ụkwụ unu nʼime ọbara ndị iro unu, ka ire nkịta unu niile ketakwa oke nke ha.”
PSA 68:24 O Chineke, ahụla igwe ahịrị mmadụ ndị na-eso gị, bụ igwe ahịrị mmadụ nke so Chineke m, na Eze m na-aba nʼebe nsọ ahụ.
PSA 68:25 Ndị na-abụ abụ nọ nʼihu, ndị na-eti egwu, na-eso ha nʼazụ; ụmụ agbọghọ na-akpọ ụbọ sokwa ha.
PSA 68:26 Too Chineke nʼetiti nzukọ ukwuu ahụ; toonu Onyenwe anyị nʼetiti nzukọ ụmụ Izrel.
PSA 68:27 Lee Benjamin bụ agbụrụ dịkarịsịrị nta, ka ọ na-edu ha, lekwaa igwe ụmụ ndị eze Juda na nke Zebụlọn na Naftalị.
PSA 68:28 O Chineke, kpọlite ike gị; mee ka ike gị pụta ìhè, O Chineke, dịka i mere na mbụ.
PSA 68:29 Nʼihi ụlọnsọ ukwu gị nke dị na Jerusalem, ndị eze ga-ewetara gị onyinye dị iche iche.
PSA 68:30 Baara anụ ọhịa ahụ zoro nʼetiti riidi mba, igwe oke ehi nọ nʼetiti ụmụ ehi nke mba niile. Site na nweda nʼala, ka o wetara gị ogbe ọlaọcha. Chụsasịa mba niile, bụ ndị na-enwe mmasị nʼibu agha.
PSA 68:31 Ndị nnọchi anya obodo, ga-esite nʼIjipt bịa, Kush ga-etinye onwe ya nʼokpuru Chineke.
PSA 68:32 Bụkuo Chineke abụ, unu alaeze niile nke ụwa, bụkuo Onyenwe anyị abụ otuto, Sela
PSA 68:33 Bụọ abụ nye onye na-agba ịnyịnya nʼeluigwe, e, ọ bụladị eluigwe nke dịrị site na mgbe ochie, onye olu ike ya dịka egbe eluigwe.
PSA 68:34 Kwusaa ike Chineke, onye ịdị ukwuu nke ịma mma ya na-ekpuchi Izrel, onye ike ya dị nʼeluigwe.
PSA 68:35 O Chineke, ị dị oke egwu nʼime ụlọnsọ gị; Chineke nke Izrel na-enye ndị ya ume na ike. Toonu Chineke!
PSA 69:1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Eji olu abụ “Okoko Lili.” Abụ Devid. O Chineke, zọpụta m, nʼihi na mmiri abịaruola m nʼolu.
PSA 69:2 Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi, e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị. Abịala m nʼebe mmiri dị omimi; uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m.
PSA 69:3 Akpịrị akpọọla m nkụ; ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka. Anya m agbaala ọchịchịrị ebe m na-ele anya Chineke.
PSA 69:4 Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu karịa agịrị isi dị m nʼisi. Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu, bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha. Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi ihe m na-ezughị nʼohi.
PSA 69:5 Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile; ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị.
PSA 69:6 Ekwela ka ihere mee ndị na-atụkwasị gị obi nʼihi m, O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; ka ndị na-achọ gị ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m, O Chineke nke Izrel.
PSA 69:7 Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo, ihere ekpuchiela m ihu.
PSA 69:8 Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ, nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ.
PSA 69:9 Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi, ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m.
PSA 69:10 Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ, ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a.
PSA 69:11 Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m, a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị.
PSA 69:12 Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ, abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ.
PSA 69:13 O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere, nʼoge ihuọma gị; na oke ịhụnanya gị, O Chineke m, zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị.
PSA 69:14 Dọpụta m site nʼụrụrọ, ekwela ka m mikpuo; zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị, site na mmiri miri emi.
PSA 69:15 Ekwela ka uju mmiri kpuchie m, maọbụ ka ebe dị omimi loda m, ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya.
PSA 69:16 O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu.
PSA 69:17 Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị. Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m!
PSA 69:18 Bịa m nso zọpụta m. Gbapụta m site nʼaka ndị iro m.
PSA 69:19 Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere: ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu.
PSA 69:20 Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi, ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka. Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ; lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara.
PSA 69:21 Ha tinyere oluilu nʼime nri m, nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ.
PSA 69:22 Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya; ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu.
PSA 69:23 Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ ọzọ, mekwa ka ụkwụ ha na-ama jijiji mgbe niile.
PSA 69:24 Wụkwasị ha oke iwe gị, ka iwe gị dị ọkụ zute ha.
PSA 69:25 Ka ebe obibi ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ụlọ ikwu ha.
PSA 69:26 Ha na-akpagbu ndị ahụ i merụrụ ahụ, na-ekwukwa banyere ihe mgbu ndị ahụ i kwohịara ahụ.
PSA 69:27 Boo ha ebubo ajọ omume tụkwasị nʼelu ajọ omume, ekwekwala ka ha keta oke na ezi omume gị.
PSA 69:28 Mee ka e hichapụ aha ha site nʼakwụkwọ nke ndụ, ka a hapụ idekọta aha ha na nke ndị ezi omume.
PSA 69:29 Anọ m nʼụfụ na ihe mgbu, O Chineke, mee ka nzọpụta gị kpuchie m.
PSA 69:30 Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke, jirikwa ekele bulie ya elu.
PSA 69:31 Nke a ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ karịa oke ehi, karịa oke ehi, nke mpi ya na ụkwụ ya ka dị.
PSA 69:32 Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ; unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ.
PSA 69:33 Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa, ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya.
PSA 69:34 Ka eluigwe na ụwa too ya, osimiri niile na ihe niile bi nʼime ha.
PSA 69:35 Nʼihi na Chineke ga-azọpụta Zayọn; ọ ga-ewugharị obodo niile nke Juda. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ebi nʼime ya, mee ya ihe nweta ha.
PSA 69:36 Ụmụ ndị na-ejere ya ozi ga-eketa ya, ndị hụrụ aha ya nʼanya ga-ebikwa ebe ahụ nʼime ya.
PSA 70:1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Arịrịọ. O Chineke, gbata ọsọ bịa zọpụta m, O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.
PSA 70:2 Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara. Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m laghachi azụ nʼihere.
PSA 70:3 Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” laghachi azụ nʼihi ihere ha.
PSA 70:4 Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị, ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.”
PSA 70:5 Ma mụ onwe m bụ ogbenye na onye nọ na mkpa; O Chineke, mee ngwangwa bịakwute m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; O Onyenwe anyị, anọla ọdụ ịbịa.
PSA 71:1 Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m.
PSA 71:2 Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m; tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m.
PSA 71:3 Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla; nye iwu maka nzọpụta m, nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike.
PSA 71:4 O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ, ndị afọ tara mmiri, gbapụta m.
PSA 71:5 Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị, ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị.
PSA 71:6 Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m; gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Aga m anọgide na-eto gị.
PSA 71:7 Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ, ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike.
PSA 71:8 Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị, ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.
PSA 71:9 Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi; ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m.
PSA 71:10 Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m; ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo.
PSA 71:11 Ha na-asị, “Chineke agbakụtala ya azụ; chụọ ya ọsọ, jidekwa ya, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya.”
PSA 71:12 O Chineke, anọla m ebe dị anya; O Chineke m, bịa ngwangwa nyere m aka.
PSA 71:13 Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha; ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ.
PSA 71:14 Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile; aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ.
PSA 71:15 Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile, ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya.
PSA 71:16 Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị, aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị.
PSA 71:17 O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe, ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.
PSA 71:18 O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi, mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m, tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa, na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu.
PSA 71:19 O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe, gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu. O Chineke, onye dị ka gị?
PSA 71:20 Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu nke dị ilu, ị ga-atụte ndụ m ọzọ; site nʼebe dị omimi nke ụwa, ị ga-adọkpụpụta m ọzọ.
PSA 71:21 Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ. Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ.
PSA 71:22 O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị, nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị; aga m eji une bụkuo gị abụ otuto, gị Onye nsọ nke Izrel.
PSA 71:23 Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ mgbe m na-abụku gị abụ otuto, mụ, onye ị gbapụtara.
PSA 71:24 Ogologo ụbọchị niile, aga m ekwupụta ọrụ ezi omume gị niile, nʼihi na ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ, ka e tinyere nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.
PSA 72:1 Abụ nke Solomọn. O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze. Nyekwa nwa eze ezi omume gị.
PSA 72:2 Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị, jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu.
PSA 72:3 Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba; ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume.
PSA 72:4 Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ, zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa; ọ ga-egwepịa onye mmegbu.
PSA 72:5 Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide, dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile.
PSA 72:6 Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ, dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.
PSA 72:7 Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa; ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa.
PSA 72:8 Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri, na-esite nʼiyi ukwu. ruo na nsọtụ niile nke ụwa
PSA 72:9 Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya, ndị iro ya niile ga-abụ ndị e wedara nʼala.
PSA 72:10 Ndị eze Tashish na mba niile dị nʼebe dị anya, ga-atụ ụtụ wetara ya; e, ọ bụladị ndị eze si Sheba na Seba, ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye.
PSA 72:11 Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya, mba niile ga-ejekwara ya ozi.
PSA 72:12 Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya. Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka.
PSA 72:13 Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa, ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ.
PSA 72:14 Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike, nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya.
PSA 72:15 Ka ọ dị ogologo ndụ! Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba. Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile, ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile.
PSA 72:16 Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a; ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile. Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn; ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa.
PSA 72:17 Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide. A ga-esite na ya gọzie mba niile, a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.
PSA 72:18 Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel, onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche.
PSA 72:19 Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi; ka ụwa niile jupụta nʼebube ya.
PSA 72:20 Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi.
PSA 73:1 Abụ Ọma Asaf. Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma, dịkwara ndị obi ha dị ọcha.
PSA 73:2 Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ, ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ.
PSA 73:3 Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo; mgbe m hụrụ ịba ụba nke ndị ajọ omume.
PSA 73:4 Ha anaghị adọgbu onwe ha; ahụ ha gbara abụba, siekwa ike.
PSA 73:5 Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha. Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere.
PSA 73:6 Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha; ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe.
PSA 73:7 Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta; echiche ọjọọ ha enweghị ngụta.
PSA 73:8 Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu; nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ.
PSA 73:9 Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha, ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha.
PSA 73:10 Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha, na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri.
PSA 73:11 Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara? Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?”
PSA 73:12 Otu a ka ndị ajọ omume dị, ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa.
PSA 73:13 Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha, nʼefu ka m kwọrọ aka m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ.
PSA 73:14 Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu; ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ.
PSA 73:15 Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,” agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị.
PSA 73:16 Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile, ọ ghọọrọ m ihe mwute,
PSA 73:17 tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke; mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ.
PSA 73:18 Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị; ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi.
PSA 73:19 Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya, bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam!
PSA 73:20 Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta, otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara, ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu.
PSA 73:21 Mgbe m nọ nʼobi mwute; mmụọ m dara mba.
PSA 73:22 Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe. Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị.
PSA 73:23 Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m.
PSA 73:24 Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m, ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị.
PSA 73:25 Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.
PSA 73:26 Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba, ma Chineke bụ ike nke obi m, na ihe nketa m ruo ebighị ebi.
PSA 73:27 Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi. Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi.
PSA 73:28 Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso. Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ebe mgbaba m. Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.
PSA 74:1 Abụ maskil nke Asaf. Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi? Gịnị mere iwe gị ji akwụ anwụrụ megide igwe atụrụ ndị ị na-azụ?
PSA 74:2 Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie, ebo ahụ bụ ihe nketa gị, ndị ị gbapụtara, nʼugwu Zayọn ebe i biri.
PSA 74:3 Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a. Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a.
PSA 74:4 Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị. Ha weliri ọkọlọtọ ha dịka ihe ịrịbama.
PSA 74:5 Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike ha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa.
PSA 74:6 Ha ji anyụike na egbugbu ha kụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe.
PSA 74:7 Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa. Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị.
PSA 74:8 Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!” Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ.
PSA 74:9 Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke. Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ.
PSA 74:10 O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị? Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi?
PSA 74:11 Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi!
PSA 74:12 Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie. Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa.
PSA 74:13 Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ. Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri.
PSA 74:14 Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan, mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara.
PSA 74:15 Ọ bụ gị mere ka isi iyi na mmiri iyi na-asọ. I mere ka osimiri na-eru eru mgbe niile taa.
PSA 74:16 Ehihie na abalị bụ nke gị. I mere ka anyanwụ na ọnwa guzosie ike.
PSA 74:17 Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa. Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị.
PSA 74:18 O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị, na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo.
PSA 74:19 Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka. Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 74:20 Chetakwa ọgbụgba ndụ gị, nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a.
PSA 74:21 Ekwela ka ndị a na-akpagbu gbaghachi azụ nʼihere; ka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa too aha gị.
PSA 74:22 O Chineke, bilie, kpechitara onwe gị ikpe. Chetakwa otu ndị nzuzu si kọọ gị ọnụ ogologo ụbọchị niile.
PSA 74:23 Elepụla mkpọtụ nke ndị iro gị niile anya, olu mkpọtụ nke ndị iro gị na-aga nʼihu na-ala elu.
PSA 75:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ. Anyị na-eto gị, O Chineke. Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso. Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche.
PSA 75:2 Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka. Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi.
PSA 75:3 Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji, ọ bụ m na-ejidesi ogidi ya ike ka o guzo chịm. Sela
PSA 75:4 Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ, nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi unu elu.
PSA 75:5 Unu ewelila mpi unu megide eluigwe; unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’ ”
PSA 75:6 Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ, maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu.
PSA 75:7 Kama ọ bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe; ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala.
PSA 75:8 Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche. Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị.
PSA 75:9 Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi. Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto,
PSA 75:10 bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile, ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”
PSA 76:1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ. A maara Chineke nʼobodo Juda; aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel.
PSA 76:2 Ụlọ ikwu ya dị na Salem, ebe obibi ya dị na Zayọn
PSA 76:3 Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma, na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. Sela
PSA 76:4 Ị jupụtara nʼìhè, ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara.
PSA 76:5 A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha, ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha; o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a pụrụ iweli aka ya abụọ elu.
PSA 76:6 Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb, ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.
PSA 76:7 Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe?
PSA 76:8 I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị. Ụwa tụkwara egwu, dere duu,
PSA 76:9 mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe, ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a. Sela
PSA 76:10 Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto, ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu.
PSA 76:11 Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha; ka ndị ala niile bụ agbataobi unu wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche.
PSA 76:12 Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala; ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.
PSA 77:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ nke Asaf. Abụ Ọma. Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka; etikuru m Chineke mkpu ka ọ nụrụ olu m.
PSA 77:2 Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ. Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị, mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi.
PSA 77:3 O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude; echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. Sela
PSA 77:4 I kweghị ka anya m abụọ mechie; nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu.
PSA 77:5 Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga, na afọ niile ndị gara aga.
PSA 77:6 Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị. Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ntụgharị uche, mmụọ m jụkwara ajụjụ.
PSA 77:7 “Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi? Ọ pụtara na ọ gaghị egosi ihuọma ya ọzọ?
PSA 77:8 Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla? Ọ pụtara na nkwa ya agaghị emezu ruo ebighị ebi?
PSA 77:9 Chineke, o chefuola i mere anyị ebere? O jichiela ọmịiko ya nʼihi iwe?” Sela
PSA 77:10 Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m, afọ niile mgbe Onye kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya.
PSA 77:11 Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ; e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga.
PSA 77:12 Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile, tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.”
PSA 77:13 O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ. Olee chi dị ukwuu dịka Chineke anyị?
PSA 77:14 Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche; ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ.
PSA 77:15 I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị, bụ ụmụ ụmụ Jekọb na Josef. Sela
PSA 77:16 Osimiri hụrụ gị, O Chineke, osimiri hụrụ gị, taa; ogbu mmiri mere mkpọtụ.
PSA 77:17 Igwe ojii wụpụrụ mmiri, mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe; àkụ gị gburu amụma ebe niile.
PSA 77:18 A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe, amụma gị nyere ụwa niile ihe; elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu.
PSA 77:19 Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara, ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri, ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya.
PSA 77:20 I sitere nʼaka Mosis na Erọn duo ndị gị dịka igwe atụrụ.
PSA 78:1 Abụ maskil nke Asaf. Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi; geenụ ntị nʼokwu ọnụ m.
PSA 78:2 Aga m eji ilu malite okwu m, aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie;
PSA 78:3 ihe ndị anyị nụrụla, marakwa, ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị.
PSA 78:4 Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a, kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị, na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.
PSA 78:5 O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya, mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel, bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị, ka ha kuziere ụmụ ha,
PSA 78:6 ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya, ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị, ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.
PSA 78:7 Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha, ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche. Ha ga-edebekwa iwu ya niile.
PSA 78:8 Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha, ọgbọ ndị nnupu isi na ndị isiike; ndị obi ha na-adịghị nʼebe Chineke nọ, ndị mmụọ ha na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ya.
PSA 78:9 Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha, chigharịrị azụ, gbaa ọsọ nʼụbọchị agha.
PSA 78:10 Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke. Ha jụkwara ibi ndụ dịka iwu ya si dị.
PSA 78:11 Ha chefuru ihe o mere, ọrụ ịtụnanya o gosiri ha.
PSA 78:12 Chineke rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihu nna nna ha nʼala Ijipt na nʼọhịa Zoan.
PSA 78:13 O kewara oke osimiri, site nʼetiti ya dufee ha. O mere ka mmiri ahụ guzo ọtọ dịka mgbidi.
PSA 78:14 O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie, jirikwa ìhè sitere nʼọkụ ahụ, duo ha ogologo abalị niile.
PSA 78:15 Ọ gbawara oke nkume dị nʼọzara, si otu a nye ha mmiri hiri nne, dịka a ga-asị na ọ bụ mmiri si nʼọtụtụ oke osimiri.
PSA 78:16 O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta, mee ka mmiri rudata dịka osimiri.
PSA 78:17 Ha nọgidere na-emehie megide ya. Ha nupuru isi nʼọzara megide Onye kachasị ihe niile elu.
PSA 78:18 Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa, mgbe ha rịọrọ ya nri nke obi ha chọrọ.
PSA 78:19 Ha kwuhiere Chineke; jụọ ya ọnụ sị, “Chineke ọ pụrụ inye anyị ezi nri na mmiri ọṅụṅụ nʼọzara a?
PSA 78:20 Ọ bụ ezie na o tiri nkume ahụ ihe, mee ka mmiri sọpụta, mmiri iyi sọpụtara nʼebe o hiri nne, ma ọ pụrụ inye anyị nri? Ọ pụrụ inye ndị ya anụ?”
PSA 78:21 Mgbe Onyenwe anyị nụrụ ihe ha kwuru, iwe were ya; ọkụ ya repịara Jekọb, iwe ọkụ ya biliri megide Izrel.
PSA 78:22 Nʼihi na ha ekwenyeghị na Chineke, maọbụ tụkwasị obi na nzọpụta ya.
PSA 78:23 Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe.
PSA 78:24 O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie. O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe.
PSA 78:25 Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi. O zitere ha nri niile ha nwere ike iri.
PSA 78:26 O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ, o jikwa ike ya duo ikuku nke ndịda.
PSA 78:27 O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu, anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri.
PSA 78:28 O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha nakwa gburugburu ụlọ ikwu ha.
PSA 78:29 Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ, nʼihi na o nyere ha ihe obi ha chọrọ.
PSA 78:30 Ha erisibeghị nri ahụ obi ha chọrọ, anụ ụfọdụ dịkwa ha nʼọnụ,
PSA 78:31 mgbe iwe Chineke biliri imegide ha; o tigburu ndị kachasị ike nʼetiti ha, tigbukwaa ụmụ okorobịa ndị Izrel.
PSA 78:32 Ma na-eleghị ihe ndị a anya, ha gakwara nʼihu na mmehie ha, jụkwa ikwere nʼọrụ ebube niile Onyenwe anyị rụrụ.
PSA 78:33 O mere ka ụbọchị ndụ ha bụrụ ihe efu. O mekwara ka afọ ha gwụsịa nʼobi ọlụlọ mmiri.
PSA 78:34 Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya; ha na-alaghachi azụ, chọsie ya ike.
PSA 78:35 Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha, na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta.
PSA 78:36 Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe, were ire ha na-aghara ya ụgha.
PSA 78:37 Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya. Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya.
PSA 78:38 Ma o meere ha ebere. Ọ gbaghara ha mmehie ha. Ọ laghị ha nʼiyi. Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya. Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya.
PSA 78:39 Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke, chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị.
PSA 78:40 Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara; ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.
PSA 78:41 Mgbe mgbe, ha nwara Chineke; ha kpasuru Onye Nsọ nke Izrel iwe.
PSA 78:42 Ha echetaghị ike ya, ụbọchị ahụ ọ gbapụtara ha site nʼaka ndị na-emegbu ha;
PSA 78:43 nʼụbọchị o gosipụtara ihe ịrịbama niile nʼala Ijipt, ọrụ ebube ya niile nʼọhịa Zoan.
PSA 78:44 O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara. Ha enwekwaghị ike ịṅụ mmiri si na ha.
PSA 78:45 O zigakwara igwe ijiji nʼetiti ha, nke tara ha, zitekwa awọ nʼala ha, nke bibiri ha.
PSA 78:46 O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha, zitekwa igurube nke ripịara ihe niile a gaara eweta dịka ihe ubi.
PSA 78:47 O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha, jirikwa igirigi jụrụ oke oyi bibie osisi sikamọ ha niile.
PSA 78:48 O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri, werekwa anụ ụlọ ha nyefee amụma egbe eluigwe.
PSA 78:49 O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha, oke iwe ya, na iwe ya, na mmeso nke iwe ya, ndị mmụọ ozi na-ebibi ihe na-eleghị anya nʼazụ.
PSA 78:50 O doziri ụzọ nke iwe ya ga-eso; o gbochighị ka ha ghara ịnwụ; kama o nyefere ndụ ha nʼaka ọrịa na-efe efe.
PSA 78:51 O tigburu nwa ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom nʼime ụlọ ikwu Ham.
PSA 78:52 Ma o dupụtara ndị nke ya dịka igwe atụrụ; o duuru ha dịka atụrụ gafee ọzara.
PSA 78:53 O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha, ma osimiri kpuchigidere ndị iro ha.
PSA 78:54 Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya, ala ugwu ugwu ahụ nke aka nri ya nwetara.
PSA 78:55 Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha, tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa; o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha.
PSA 78:56 Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa, nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu; ha edebeghị ụkpụrụ ya.
PSA 78:57 Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ, ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma.
PSA 78:58 Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya; sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya.
PSA 78:59 Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam.
PSA 78:60 Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ.
PSA 78:61 O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka.
PSA 78:62 O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha; iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya.
PSA 78:63 Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha, ọ dịkwaghị onye a gụụrụ egwu ọlụlụ di na nwunye, nʼetiti ụmụ agbọghọ ha;
PSA 78:64 E gburu ndị nchụaja ha nʼagha; ndị inyom ha ndị di ha nwụrụ enwekwaghị ike iru ụjụ.
PSA 78:65 Mgbe ahụ, onyenwe anyị tetara dịka onye si nʼụra teta, dịka dike si nʼụra mmanya teta.
PSA 78:66 Ọ chụghachiri ndị iro ya azụ, mee ha ihe ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi.
PSA 78:67 Ọ jụrụ ụlọ ikwu Josef, ọ họpụtaghị ebo Ifrem;
PSA 78:68 ma ọ họọrọ ebo Juda, na ugwu Zayọn, nke ọ hụrụ nʼanya.
PSA 78:69 O wuru ụlọnsọ ya ka ọ dị ka ebe dị elu, dịka ụwa nke o mere ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 78:70 Ọ họpụtara Devid, ohu ya, kpọrọ ya site nʼọgba igwe atụrụ;
PSA 78:71 o si nʼebe ọ nọ na-azụ atụrụ kpọrọ ya, ka ọ bịa bụrụ onye na-azụ ndị ya Jekọb, na Izrel, ihe nketa ya dịka atụrụ.
PSA 78:72 Devid ji izuoke nke obi ya zụọ ha, aka nke maara ihe ọ na-eme ka o ji duo ha.
PSA 79:1 Abụ Ọma Asaf. O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị; ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị, ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
PSA 79:2 Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha, werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa.
PSA 79:3 Ha awụpụla ọbara dịka mmiri nʼakụkụ niile nke Jerusalem, ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ.
PSA 79:4 Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ, ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo.
PSA 79:5 O Onyenwe anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi? Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ?
PSA 79:6 Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị dịka Chineke oke iwe gị, bụ alaeze niile ndị ahụ na-adịghị akpọku aha gị;
PSA 79:7 nʼihi na ha eripịala Jekọb mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu.
PSA 79:8 Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa.
PSA 79:9 Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, nʼihi ebube nke aha gị; napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile nʼihi aha gị.
PSA 79:10 Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?” Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ, na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru.
PSA 79:11 Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ; site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ.
PSA 79:12 Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị.
PSA 79:13 Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi; anyị ga na-ekwupụta otuto gị, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
PSA 80:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ” Abụ Ọma nke Asaf. Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel, gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ. Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim, nwupụta Ìhè
PSA 80:2 nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase. Kpọtee ịdị ike gị, bịa zọpụta anyị.
PSA 80:3 O Chineke, kpọghachi anyị azụ, mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
PSA 80:4 O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụ megide ekpere ndị gị?
PSA 80:5 I jirila anya mmiri dịka a ga-asị na ọ bụ achịcha zụọ ha nri; i meela ka ha ṅụọ anya mmiri nʼihe ọtụtụ.
PSA 80:6 I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị, ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị.
PSA 80:7 O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ, mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
PSA 80:8 I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị; ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya.
PSA 80:9 Ị sụchaara ya ala, mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile.
PSA 80:10 Ndo ya kpuchiri ugwu niile, alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida.
PSA 80:11 Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri wasaakwa ume ya ruo osimiri.
PSA 80:12 Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya?
PSA 80:13 Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya, ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri.
PSA 80:14 Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ! Letakwa osisi vaịnị a,
PSA 80:15 mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị.
PSA 80:16 E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya; mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi.
PSA 80:17 Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị, nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị.
PSA 80:18 Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ; tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị.
PSA 80:19 Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike zọpụta anyị.
PSA 81:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ nke Asaf nʼusoro gittit. Bụkuo Chineke bụ ike anyị abụ ọṅụ, tikusie Chineke Jekọb mkpu ike!
PSA 81:2 Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu, kpọọnụ ụbọ akwara na-enye abụ ụtọ na une.
PSA 81:3 Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ, na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị;
PSA 81:4 nke a bụ iwu dịrị Izrel, ụkpụrụ Chineke nke Jekọb.
PSA 81:5 O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef mgbe ọ pụrụ imegide Ijipt. Anụkwara m olu nʼasụsụ nke m na-amaghị, ka ọ na-asị:
PSA 81:6 “Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha; aka ha abụọ nwere onwe ha site nʼịrụ ọrụ.
PSA 81:7 Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu, azara m unu site nʼegbe eluigwe; anwara m unu na mmiri nke Meriba. Sela
PSA 81:8 “Nụrụnụ, ndị m, aga m adọ unu aka na ntị, a sịkwarị na unu ga-ege m ntị, unu ndị Izrel!
PSA 81:9 Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu; unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ.
PSA 81:10 Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt. Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya.
PSA 81:11 “Ma ndị m ekweghị ige m ntị. Izrel emekwaghị dịka m gwara ha.
PSA 81:12 Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha, ka ha soro nchepụta nke echiche ha.
PSA 81:13 “Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị, a sịkwa na Izrel ga-eso ụzọ m niile.
PSA 81:14 Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha. Aga m eweli aka m, megide ndị iro ya niile.
PSA 81:15 Ndị niile kpọrọ Onyenwe anyị asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ. Ịta ahụhụ ha ga-adịgidekwa, ruo ebighị ebi.
PSA 81:16 Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ; aga m ejikwa mmanụ aṅụ nke sitere nʼoke nkume, nyejuo unu afọ.”
PSA 82:1 Abụ Ọma Asaf. Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu; ọ na-ekpebi ikpe nʼetiti chi niile.
PSA 82:2 Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Ruo ole mgbe ka unu ga na-egosi ndị ajọ omume ihuọma? Sela
PSA 82:3 Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi; hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha.
PSA 82:4 Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa; napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume.
PSA 82:5 Ha amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla. Ha na-ejegharị nʼọchịchịrị; ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji.
PSA 82:6 “Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,” unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke Onye kachasị ihe niile elu.’
PSA 82:7 Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ; unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ.”
PSA 82:8 O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe, nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị.
PSA 83:1 Abụ, bụ Abụ Ọma Asaf. O! Chineke agbachikwala nkịtị. Biko, Chineke, ahapụkwala ikwu okwu, anọkwala jụụ.
PSA 83:2 Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ, ndị kpọrọ gị asị na-eweli isi ha.
PSA 83:3 Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị; ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya.
PSA 83:4 Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi, ka a ghara ichetakwa aha Izrel ọzọ.”
PSA 83:5 Ha ji otu obi na-agbarịta izu; ha agbaala ndụ imegide gị,
PSA 83:6 ụlọ ikwu niile nke ndị Edọm, na ndị Ishmel, na ndị Moab, na ndị Haga,
PSA 83:7 na ndị Gebal, na ndị Amọn, na ndị Amalek, na ndị Filistia, ha na ndị Taịa.
PSA 83:8 Ọ bụladị ndị Asịrịa esorokwala ha, ịgba ndị agbụrụ Lọt ume. Sela
PSA 83:9 Mee ha dịka i si mee ndị Midia, na dịka i mere Sisera na Jabin, nʼakụkụ iyi Kishọn,
PSA 83:10 ndị lara nʼiyi nʼEndoa ma ghọọ ihe dịka nsị anụ e kpofuru ekpofu nʼala.
PSA 83:11 Mee ka ndị ọgaranya ha dịka Oreb na Zeeb, ka ụmụ ndị ikom eze ha niile dịka Zeba na Zalmuna,
PSA 83:12 ndị sịrị, “Ka anyị nwetara onwe anyị, ebe ịta nri ụmụ anụmanụ niile nke Chineke.”
PSA 83:13 O Chineke m, mee ha ka dịka ahịhịa ifufe na-efegharị gburugburu, maọbụ dịka igbugbo ọka nʼebe ifufe dị.
PSA 83:14 Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa, maọbụ nke na-ere nʼelu ugwu,
PSA 83:15 si otu a were oke ifufe chụọ ha ọsọ, jiri oke ifufe nke na-eso mmiri ozuzo mee ka ha nọrọ nʼọnọdụ obi ọlụlọ mmiri.
PSA 83:16 Were ihere kpuchie ha ihu, ka ndị mmadụ si otu a chọọ aha gị, O Onyenwe anyị.
PSA 83:17 Ka ha nọdụ nʼọnọdụ ihere na ịda mba mgbe niile; ka ha laa nʼiyi nʼọnọdụ mweda nʼala.
PSA 83:18 Mee ka ha mata na gị, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, na ọ bụ naanị gị bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile.
PSA 84:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora nʼusoro gittit. Lee ka ebe obibi gị sị maa mma, O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile!
PSA 84:2 Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba, ịbata nʼogige Onyenwe anyị; mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu na-achọ Chineke dị ndụ.
PSA 84:3 Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi; eleke achọtakwarala onwe ya akwụ, ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya, nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị, O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m.
PSA 84:4 Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; ha na-eto gị mgbe niile. Sela
PSA 84:5 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị, ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem.
PSA 84:6 Mgbe ha na-esite na Ndagwurugwu Baka na-agafe, ha na-eme ya ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche na-asọpụta; mmiri ozuzo mbụ na-ewere ngọzị niile kpuchie ya.
PSA 84:7 Ike ha na-abawanye abawanye, tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu Chineke na Zayọn.
PSA 84:8 O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m. Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb.
PSA 84:9 Lekwasị anya nʼọta anyị, O Chineke, jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya.
PSA 84:10 Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị, karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ; ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m, karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume.
PSA 84:11 Onyenwe anyị Chineke bụ anyanwụ na ọta; Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ; ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ.
PSA 84:12 O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụkwasị gị obi.
PSA 85:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora. O Onyenwe anyị, i gosila ala gị ihuọma; i nyeghachila Jekọb akụnụba ya.
PSA 85:2 I gbagharala ajọ omume ndị gị, kpuchikwaa mmehie ha niile. Sela
PSA 85:3 Ị kwụsịla iwe oke iwe gị, I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa.
PSA 85:4 Kpọghachi anyị azụ, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ.
PSA 85:5 Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe: Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile?
PSA 85:6 Ị gaghị eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ ka ndị gị ṅụrịa ọṅụ nʼime gị?
PSA 85:7 O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide, nyekwa anyị nzọpụta gị.
PSA 85:8 Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu; ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo, ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu.
PSA 85:9 Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya, ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị.
PSA 85:10 Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ.
PSA 85:11 Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya.
PSA 85:12 Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya.
PSA 85:13 Ezi omume ga-aga nʼihu ya, idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.
PSA 86:1 Ekpere Devid. Gee m ntị, O Onyenwe anyị, ma zakwa m, nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa.
PSA 86:2 Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi; zọpụta ohu gị onye nke na-atụkwasị gị obi. Ị bụ Chineke m;
PSA 86:3 meere m ebere, O Onyenwe m, nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile.
PSA 86:4 Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m, ka m na-eweliri mkpụrụobi m.
PSA 86:5 Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m, i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị.
PSA 86:6 O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m; gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere.
PSA 86:7 Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị, nʼihi na ị ga-aza m.
PSA 86:8 Nʼetiti chi niile, i nweghị oyiri, O Onyenwe m; ọ dịghị ọrụ ebube ọbụla a pụrụ ị sị na ọ dị ka nke ị na-arụ.
PSA 86:9 Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị, fee gị ofufe, O Onyenwe anyị; ha ga-ebutere aha gị ebube.
PSA 86:10 Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche; ọ bụ naanị gị bụ Chineke.
PSA 86:11 Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị, ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị; nye m obi na-adịghị agba abụọ, ka m nwee ike tụọ egwu aha gị.
PSA 86:12 Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m; aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi.
PSA 86:13 Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu; i sitela nʼomimi nke dị ala site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m.
PSA 86:14 O Chineke, ndị mpako na-emegide m; otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m, ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla.
PSA 86:15 Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara, iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
PSA 86:16 Chee m ihu, mekwaara m amara. Nye ohu gị ike gị, zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyị nʼihi na m na-ejere gị ozi.
PSA 86:17 Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị, ka ndị iro m hụ ya si otu a bụrụ ndị ihere ga-eme, nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, nyere m aka ma kasịekwa m obi.
PSA 87:1 Abụ Ọma ụmụ Kora. Otu Abụ. Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ;
PSA 87:2 Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya, karịa ebe obibi niile nke Jekọb.
PSA 87:3 Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị, O obodo Chineke; Sela
PSA 87:4 “Aga m agụnye Rehab na Babilọn, dịka ndị na-asọpụrụ m, aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush, aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’ ”
PSA 87:5 Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị, “A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya, ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.”
PSA 87:6 Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ: “A mụrụ onye a na Zayọn.”
PSA 87:7 Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị, “Isi iyi m niile dị na gị.”
PSA 88:1 Abụ, bụ Abụ Ọma ụmụ Kora, nke dịrị onyeisi Abụ. Nʼusoro olu abụ Mahalat leannot. Abụ Maskil nke Heman onye Ezra. O Onyenwe anyị, Chineke onye na-azọpụta m, nʼehihie na abalị ka m na-eti mkpu akwa nʼihu gị.
PSA 88:2 Ka ekpere m bịa nʼihu gị. Chee ntị gị nụrụ akwa m.
PSA 88:3 Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m, anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ.
PSA 88:4 Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu. Adị m dịka onye na-enweghị ike.
PSA 88:5 A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche, dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili, ndị ị nakwaghị echeta ọzọ, ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị.
PSA 88:6 Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi, olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya.
PSA 88:7 Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu; i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. Sela
PSA 88:8 Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya, mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ. Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi;
PSA 88:9 anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ. O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị; ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị,
PSA 88:10 ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị? Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị? Sela
PSA 88:11 Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị? A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi?
PSA 88:12 A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị? Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ?
PSA 88:13 Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku. Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ.
PSA 88:14 O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m? Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị?
PSA 88:15 Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso; ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba.
PSA 88:16 Oke iwe gị agabigala nʼahụ m; ihe egwu gị alaala m nʼiyi.
PSA 88:17 Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri; ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile.
PSA 88:18 Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya; ọchịchịrị bụ enyi m nọkarịsịrị m nso.
PSA 89:1 Abụ maskil nke Etan, onye Ezra. Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị.
PSA 89:2 Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe.
PSA 89:3 Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị,
PSA 89:4 ‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela
PSA 89:5 O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ.
PSA 89:6 Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị? Onye yiri Onyenwe anyị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile?
PSA 89:7 Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu; ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu.
PSA 89:8 O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị? Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu.
PSA 89:9 Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ; mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ.
PSA 89:10 Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.
PSA 89:11 Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya.
PSA 89:12 Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị.
PSA 89:13 Aka gị ka e mejupụtara nʼike; aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu.
PSA 89:14 Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị; ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị.
PSA 89:15 Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ, ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị.
PSA 89:16 Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile; ha na-aṅụrị nʼezi omume gị.
PSA 89:17 Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha, site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu.
PSA 89:18 Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị, eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel.
PSA 89:19 I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ, nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị: “Enyela m otu onye dị ike agha ike; Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m.
PSA 89:20 Achọtala m Devid ohu m, were mmanụ nsọ m tee ya.
PSA 89:21 Aka m ga-agba ya ume; nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike.
PSA 89:22 Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede; ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya.
PSA 89:23 Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya. Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi.
PSA 89:24 Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya, site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu.
PSA 89:25 M ga-edo aka ya nʼoke osimiri, dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile.
PSA 89:26 Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’
PSA 89:27 Aga m eme ya nwa mbụ m, onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ.
PSA 89:28 Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi, ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa.
PSA 89:29 Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa dịka eluigwe na-adịgide.
PSA 89:30 “Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya, gharakwa ijegharị nʼụzọ m niile,
PSA 89:31 ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya, hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu,
PSA 89:32 aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha, tikwaa ha ụtarị maka njehie ha;
PSA 89:33 ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ. Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m.
PSA 89:34 Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m. Agakwaghị m agbanwe ihe ọbụla siterela nʼọnụ m pụta.
PSA 89:35 Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie na m apụghị ịghara Devid ụgha,
PSA 89:36 na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide.
PSA 89:37 Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa. E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” Sela
PSA 89:38 Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa, i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ.
PSA 89:39 Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala.
PSA 89:40 Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu, i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa.
PSA 89:41 Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere. Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo.
PSA 89:42 I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu; mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ.
PSA 89:43 I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ, i nyereghị ya aka mgbe agha dara.
PSA 89:44 I meela ka ịma mma ya gwụsịa. Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala.
PSA 89:45 I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ. I ji ihere dịka akwa kpuchie ya.
PSA 89:46 Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị? Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ?
PSA 89:47 Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa. Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile!
PSA 89:48 Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya, maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili? Sela
PSA 89:49 O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị, nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi?
PSA 89:50 Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya, otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile.
PSA 89:51 O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo, nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ.
PSA 89:52 Otuto dịrị Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 90:1 Ekpere Mosis, bụ onyeozi Chineke. O Onyenwe anyị, ebe obibi ka gị onwe gị bụrịị nye anyị nʼọgbọ niile.
PSA 90:2 Tupu e kee ugwu niile, na tupu a kpụọ ụwa na elu ụwa, siterị na mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi, ị bụ Chineke.
PSA 90:3 Ị na-eme ka mmadụ laghachi bụrụ aja mgbe i kwuru okwu sị, “Unu ụmụ mmadụ, laghachi bụrụ aja.”
PSA 90:4 Puku afọ dị nʼanya gị dịka otu ụbọchị; ha dịka ụnyaahụ gafere agafe maọbụ ka otu awa nke anyasị.
PSA 90:5 Nʼime ụra nke ọnwụ ka ị na-ekpochapụ mmadụ; ha dịka ahịhịa ọhụrụ nke na-epupụta nʼisi ụtụtụ,
PSA 90:6 ọ bụ ezie na ọ na-agbawa ụzarị na-etokwa eto nʼụtụtụ, ma nʼanyasị, ọ na-akpọnwụ ma-achanwụkwaa.
PSA 90:7 E meela ka anyị gwụsịa nʼihi oke iwe gị megide anyị; anyị na-amakwa jijiji nʼihi ọnụma gị.
PSA 90:8 Ị gbasaala njehie anyị niile nʼihu gị. Ị na-ahụzukwa mmehie nzuzo anyị niile.
PSA 90:9 Ogologo ụbọchị anyị niile na-agabiga nʼoke iwe gị; afọ ndụ anyị nke fọdụrụ ka anyị na-ebi dịka okwu e ji nwayọọ kwuo na mwute.
PSA 90:10 Ogologo ụbọchị anyị niile nwere ike ruo afọ iri asaa, maọbụ afọ iri asatọ, ma ọ bụrụ na ike anyị adịgide, ma otu ọ dị, nke a ga-asị na ọ bụ ya kachasị mma na-ejupụta na nsogbu na ịsụ ude, nʼihi na ha na-agabiga ọsịịsọ, anyị onwe anyị na-efelakwa.
PSA 90:11 Onye pụrụ ịghọta ịdị ike nke oke iwe gị? Nʼihi na oke iwe gị dị ukwuu dịka ịtụ egwu kwesiri gị si dị ukwuu.
PSA 90:12 Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ, ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.
PSA 90:13 O Onyenwe anyị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị? Meere ndị ohu gị ebere.
PSA 90:14 Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ, ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile.
PSA 90:15 Mee ka anyị nwee obi ụtọ, nke ọnụọgụgụ ụbọchị ya ga-adịkwa ka ọnụọgụgụ ụbọchị niile ị tara anyị ahụhụ, ka ọnụọgụgụ afọ ya dịkwa ka ọnụọgụgụ afọ niile anyị hụrụla nsogbu.
PSA 90:16 Kwere ka ndị ohu gị hụ ọrụ gị dị iche iche, ka ụmụ ha hụkwa ịma mma gị.
PSA 90:17 Ka ihuọma Chineke, Onyenwe anyị dịkwasị anyị; mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike, e, mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike.
PSA 91:1 Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile.
PSA 91:2 Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m.”
PSA 91:3 Nʼezie, ọ ga-anapụta gị site nʼọnya nke onye osi ọnya na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi.
PSA 91:4 Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị. Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ, ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta.
PSA 91:5 Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị, maọbụ àkụ na-efegharị nʼehihie,
PSA 91:6 maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị, ma ọ bụkwanụ ihe mbibi mberede na-eme nʼehihie.
PSA 91:7 Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị, iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị, ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso.
PSA 91:8 Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ntaramahụhụ nke ndị ajọ omume.
PSA 91:9 Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị, ọ bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m,
PSA 91:10 mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị; ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso.
PSA 91:11 Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ka ha chebe gị nʼụzọ gị niile.
PSA 91:12 Ha ga-eji ọbụ aka ha, bulie gị elu ime ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.
PSA 91:13 Ị ga-azọkwasị ọdụm na ajụala ụkwụ, zọgbukwaa ọdụm na-akpa ike, na agwọ ọjọọ.
PSA 91:14 “Nʼihi na ọ hụrụ m nʼanya, Mụ onwe m ga-agbapụta ya, ka Onyenwe anyị kwuru; aga m echebe ya, nʼihi na ọ maara aha m.
PSA 91:15 Ọ ga-akpọku m, aga m azakwa ya. Aga m anọnyere ya nʼime nsogbu ya, aga m adọpụta, ma sọpụrụkwa ya.
PSA 91:16 Aga m eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya, gosikwa ya nzọpụta m.”
PSA 92:1 Abụ Ọma. Abụ maka ụbọchị izuike. Ọ bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị, na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu,
PSA 92:2 ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ, na ikwesi ntụkwasị obi gị nʼabalị,
PSA 92:3 jiri ihe iti egwu ụbọ akwara na une bụọrọ gị abụ dị ụtọ.
PSA 92:4 Nʼihi na ị na-eme ka obi dị m ụtọ, site nʼọrụ gị niile, o Onyenwe anyị, Ọ bụ ya mere m ji na-abụ abụ ọṅụ.
PSA 92:5 Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Onyenwe anyị. Leekwa ụdị echiche miri emi ị na-eche.
PSA 92:6 Ndị uche kọrọ amaghị nke a, ndị nzuzu enweghị nghọta,
PSA 92:7 ọ bụ ezie na ndị ajọ omume na-etopụta dịka ahịhịa ndị na-emekwa ajọ ihe na-eto na-awasa, a ga-ala ha nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 92:8 Ma gị, O Onyenwe anyị, bụ onye e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 92:9 Nʼezie, ndị iro gị niile, Onyenwe anyị, e ndị iro gị niile ga-ala nʼiyi; ndị niile na-eme ajọ ihe ka a ga-achụsasị.
PSA 92:10 I meela ka mpi m dị elu dịka oke ehi na-akpa ike; awụsala m mmanụ dị mma.
PSA 92:11 Ejirila m anya m abụọ hụ ka e meriri ndị iro m; ejirila m ntị m nụ maka ịla nʼiyi nke ndị iro m afọ tara mmiri.
PSA 92:12 Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ; ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke Lebanọn,
PSA 92:13 nke a kụrụ nʼime ụlọ Onyenwe anyị, ha ga-eto, wasaakwa nʼime ogige Chineke anyị.
PSA 92:14 Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi. Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ,
PSA 92:15 na-ekwupụta, “Onyenwe anyị bụ Onye ziri ezi; ọ bụ Oke Nkume m, ọ dịkwaghị ajọ omume dị nʼime ya.”
PSA 93:1 Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe; Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu; nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya.
PSA 93:2 Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie; ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị.
PSA 93:3 Oke osimiri niile amaliela elu, O Onyenwe anyị; oke osimiri niile eweliela olu ha elu; ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ.
PSA 93:4 Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme, ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri.
PSA 93:5 Ụkpụrụ gị niile, Onyenwe anyị na-eguzosi ike; ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.
PSA 94:1 O Onyenwe anyị, Chineke onye na-abọ ọbọ, o Chineke, onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị.
PSA 94:2 Bilie, o Onye Ikpe nke ụwa; kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha.
PSA 94:3 Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe? Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ?
PSA 94:4 Ha na-ekwuwapụ okwu mpako; ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ.
PSA 94:5 Ha na-azọpịa ndị gị, O Onyenwe anyị; ha na-emegbu ihe nketa gị.
PSA 94:6 Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa; ha na-egbu ndị na-enweghị nna.
PSA 94:7 Ha na-asị, “Onyenwe anyị anaghị ahụ ihe ndị a; Chineke Jekọb na-agba nkịtị.”
PSA 94:8 Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m; unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe?
PSA 94:9 Ọ pụtara na onye kpụrụ ntị anaghị anụ ihe? Ọ pụtara na onye kere anya anaghị ahụ ụzọ?
PSA 94:10 Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ? Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma?
PSA 94:11 Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ; ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi.
PSA 94:12 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị, onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị;
PSA 94:13 ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu; tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu.
PSA 94:14 Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị ajụ ndị ya; ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ.
PSA 94:15 Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile; ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya.
PSA 94:16 Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume? Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe?
PSA 94:17 A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka, agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ.
PSA 94:18 Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,” ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m.
PSA 94:19 Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m, nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ.
PSA 94:20 A ga-ejikọta gị na ocheeze ọchịchị ya rụrụ arụ, nke na-eweta mmekpa ahụ site nʼiwu ya?
PSA 94:21 Ndị ajọ omume na-ejikọta onwe ha imegide ndị ezi omume na-amakwa ndị aka ha dị ọcha ikpe ọnwụ.
PSA 94:22 Ma Onyenwe anyị a bụrụla ebe mgbaba e wusiri ike nye m, na Chineke m na oke nkume ebe m na-ezere ndụ.
PSA 94:23 Ọ ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ kwesiri mmehie ha, lakwaa ha nʼiyi nʼihi ajọ omume ha; Onyenwe anyị Chineke anyị ga-ala ha nʼiyi.
PSA 95:1 Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ.
PSA 95:2 Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma.
PSA 95:3 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke dị ukwuu, eze ukwuu kachasị chi niile elu.
PSA 95:4 Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya, ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya.
PSA 95:5 Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha, aka ya kpụrụ ala akọrọ niile.
PSA 95:6 Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị;
PSA 95:7 nʼihi na ọ bụ Chineke anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya,
PSA 95:8 “Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba, maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara,
PSA 95:9 ebe nna nna unu ha nwara m, nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere.
PSA 95:10 Iri afọ anọ ka m were iwe megide ọgbọ ahụ; ekwuru m sị, ‘Ndị a bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu site nʼebe m nọ, ha amatabeghị ụzọ m niile.’
PSA 95:11 Nʼihi nke a, aṅụrụ m iyi nʼiwe, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ”
PSA 96:1 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile.
PSA 96:2 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.
PSA 96:3 Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.
PSA 96:4 Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.
PSA 96:5 Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.
PSA 96:6 Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.
PSA 96:7 Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.
PSA 96:8 Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya; werenụ onyinye bata nʼime ogige ya.
PSA 96:9 Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya; maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.
PSA 96:10 Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.” Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya; ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.
PSA 96:11 Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya.
PSA 96:12 Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ nʼihi ọṅụ.
PSA 96:13 Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa, ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee elu ụwa ikpe, jirikwa ikwesi ntụkwasị obi kpee ndị niile dị iche iche ikpe.
PSA 97:1 Onyenwe anyị bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ; ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa.
PSA 97:2 Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu; ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya.
PSA 97:3 Ọkụ na-enwu enwu na-aga nʼihu ya ọ na-erepịasị ndị iro ya nʼakụkụ ya ọbụla.
PSA 97:4 Amụma ya na-acha chazuo elu ụwa niile; ụwa niile na-ahụ ya na-ama jijiji.
PSA 97:5 Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu Onyenwe ụwa niile.
PSA 97:6 Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya; ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya.
PSA 97:7 A na-eme ka ihere mee ndị niile na-efe arụsị niile a pịrị apị ofufe, ndị na-anya isi na chi niile e jiri aka mee feenụ ya ofufe, unu chi niile!
PSA 97:8 Zayọn na-anụ ma na-aṅụrịkwa ọṅụ, obodo nta niile nke Juda na-enwekwa obi ụtọ nʼihi ikpe gị, O Onyenwe anyị.
PSA 97:9 Nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile; ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile.
PSA 97:10 Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị, nʼihi na ọ na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obi ma na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume.
PSA 97:11 Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume, ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi.
PSA 97:12 Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume, tookwanụ aha nsọ ya.
PSA 98:1 Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta.
PSA 98:2 Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile.
PSA 98:3 O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.
PSA 98:4 Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;
PSA 98:5 werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ, e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma,
PSA 98:6 jirinụ opi na opi ike, tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze.
PSA 98:7 Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya, ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
PSA 98:8 Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha, ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ;
PSA 98:9 ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe. Ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.
PSA 99:1 Onyenwe anyị bụ eze, ka mba niile maa jijiji! O wuru ocheeze ya nʼetiti cherubim, ka elu ụwa maa jijiji.
PSA 99:2 Onyenwe anyị dị ukwuu nʼime Zayọn; ọ bụ onye e buliri elu karịa mba niile dị iche iche.
PSA 99:3 Ka ha too aha gị nke dị ukwuu, dịkwa oke egwu, ọ dị nsọ.
PSA 99:4 Eze bụ onye dị ike, ọ hụrụ ikpe ziri ezi nʼanya, i meela ka ihe ziri ezi guzosie ike; nʼime Jekọb ka i mere ihe ziri ezi na ihe dị mma.
PSA 99:5 Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu, feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya; ọ dị nsọ.
PSA 99:6 Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya, Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya; ha kpọkuru Onyenwe anyị ọ zakwara ha.
PSA 99:7 Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii. Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha.
PSA 99:8 O Onyenwe anyị, Chineke anyị, ị zara ha; ị bụụrụ Izrel Chineke onye na-agbaghara mmehie, nʼagbanyeghị na ị tara ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.
PSA 99:9 Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu; na-efe ya ofufe nʼelu ugwu ya dị nsọ, nʼihi na onye dị nsọ ka Onyenwe anyị Chineke anyị bụ.
PSA 100:1 Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju. Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile.
PSA 100:2 Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe; jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya
PSA 100:3 Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ.
PSA 100:4 Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya jiri otuto baa nʼogige ya; keleenụ ya, tookwa aha ya.
PSA 100:5 Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
PSA 101:1 Abụ Ọma Devid. Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi; o Onyenwe anyị, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto.
PSA 101:2 Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla, olee mgbe ị ga-abịakwute m? Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla jegharịa nʼime ụlọ m.
PSA 101:3 Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya nʼihu m. Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị. Agaghị m enwekwa oke nʼime ya.
PSA 101:4 Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso. Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla.
PSA 101:5 Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo, onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ; agaghị m anabata onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga.
PSA 101:6 Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya, ka mụ na ha biri; onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla ga-ejere m ozi.
PSA 101:7 Onye ọbụla na-aghọ aghụghọ agaghị ebi nʼụlọ m; onye ọbụla na-ekwu okwu ụgha agaghị eguzokwa nʼihu m.
PSA 101:8 Ụtụtụ niile ka m na-eme ka ha dere duu bụ ndị ajọ omume niile nọ nʼala a; Aga m ebipụ ndị niile na-eme ajọ ihe site nʼobodo Onyenwe anyị.
PSA 102:1 Ekpere nke onye nọ na mmekpa ahụ na ọnọdụ ịda mba, na-ekwupụta otu o si dịrị ya nʼihu Onyenwe anyị. Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị; ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị.
PSA 102:2 Ezonarịla m ihu gị nʼụbọchị nsogbu m. Gee ntị nʼekpere m, zakwaa m ngwangwa.
PSA 102:3 Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ; ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ.
PSA 102:4 Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa; ana m echefu iri nri m.
PSA 102:5 Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ, enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ.
PSA 102:6 Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara, a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị.
PSA 102:7 Ana m amụ anya abalị niile; adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ.
PSA 102:8 Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị; ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ.
PSA 102:9 Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m, anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m
PSA 102:10 nʼihi oke iwe gị, i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ.
PSA 102:11 Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada. Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa.
PSA 102:12 Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi; aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
PSA 102:13 Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ, nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola; oge ahụ a kara aka eruola.
PSA 102:14 Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị; mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere.
PSA 102:15 Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị.
PSA 102:16 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya.
PSA 102:17 Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa; ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya.
PSA 102:18 Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu, ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị:
PSA 102:19 “Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya, o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa,
PSA 102:20 ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.”
PSA 102:21 Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn; a ga-eto ya na Jerusalem,
PSA 102:22 mgbe mba niile na alaeze niile, ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe.
PSA 102:23 O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m; o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ.
PSA 102:24 Nʼihi ya, ekwuru m sị, “Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ; ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
PSA 102:25 Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
PSA 102:26 Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide; ha ga-erichasị dịka akwa ochie. Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya, ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga.
PSA 102:27 Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe, ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ.
PSA 102:28 Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide; ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”
PSA 103:1 Abụ Ọma Devid. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.
PSA 103:2 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; echefukwala mmeso ọma ya niile,
PSA 103:3 ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,
PSA 103:4 onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze,
PSA 103:5 onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.
PSA 103:6 Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume, na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu.
PSA 103:7 O mere ka Mosis mata ụzọ ya, mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche:
PSA 103:8 Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya.
PSA 103:9 Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta;
PSA 103:10 ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị.
PSA 103:11 Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ.
PSA 103:12 Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.
PSA 103:13 Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
PSA 103:14 nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja.
PSA 103:15 Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa,
PSA 103:16 ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya.
PSA 103:17 Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,
PSA 103:18 nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.
PSA 103:19 Onyenwe anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe, alaeze ya na-achị ihe niile.
PSA 103:20 Toonu Onyenwe anyị, unu ndị mmụọ ozi ya, unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ, na-erubere okwu ya isi.
PSA 103:21 Toonu Onyenwe anyị unu usuu ndị agha ya niile; unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya.
PSA 103:22 Toonu Onyenwe anyị, ọrụ aka ya niile nʼebe ọbụla ọ na-achị. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
PSA 104:1 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị. O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu; ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe.
PSA 104:2 Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa; ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu
PSA 104:3 na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri. Ọ na-eji igwe ojii emere onwe ya ụgbọ agha na-ejirikwa nku nke ifufe felie elu.
PSA 104:4 O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi, meekwa ka ọkụ na-enwu enwu bụrụ ndị na-ejere ya ozi.
PSA 104:5 Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa; agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya.
PSA 104:6 I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya, mmiri tokpukwara ugwu niile.
PSA 104:7 Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ, nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ.
PSA 104:8 Ha sitere nʼelu ugwu niile, sọrọ gaa na ndagwurugwu, ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ.
PSA 104:9 Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe, gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ.
PSA 104:10 Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu, meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe.
PSA 104:11 Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụ bụrụkwa ebe akpịrị ịkpọ nkụ nke ịnyịnya ibu ọhịa na-adajụ.
PSA 104:12 Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha; nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ.
PSA 104:13 Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile; ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya.
PSA 104:14 Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ, na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya, ime ka nri site nʼala pupụta;
PSA 104:15 mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị, mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma, na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi.
PSA 104:16 A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma, osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ.
PSA 104:17 Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha; nʼosisi fịa ka ụgbala na-ewu akwụ ya.
PSA 104:18 Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa; nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha.
PSA 104:19 I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche; anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa.
PSA 104:20 Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị; ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị.
PSA 104:21 Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu, ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha.
PSA 104:22 Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara, ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha.
PSA 104:23 Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ, kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba.
PSA 104:24 Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ. Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha. Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke.
PSA 104:25 Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara; jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi, anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta.
PSA 104:26 Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị, nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu.
PSA 104:27 Ha niile na-adabere na gị, ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru.
PSA 104:28 Ị na-enye ha nri; ha na-erikwa ya. Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri, afọ na-eju ha nke ọma.
PSA 104:29 Mgbe i zonarịrị ha ihu gị, egwu na-eju ha obi. Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha, ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta.
PSA 104:30 Mgbe i zipụrụ mmụọ gị, a na-eke ha; ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa.
PSA 104:31 Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi; ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ,
PSA 104:32 onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji, onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ.
PSA 104:33 Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m; aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ.
PSA 104:34 Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ, dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
PSA 104:35 Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa. Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ. Too Onyenwe anyị gị mkpụrụobi m! Toonu Onyenwe anyị!
PSA 105:1 Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
PSA 105:2 Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile.
PSA 105:3 Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa.
PSA 105:4 Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile.
PSA 105:5 Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta,
PSA 105:6 unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.
PSA 105:7 Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile.
PSA 105:8 Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ,
PSA 105:9 ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
PSA 105:10 O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
PSA 105:11 “Aga m enye gị ala Kenan dịka oke i ga-eketa.”
PSA 105:12 Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, nʼezie ha dị ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼime ya.
PSA 105:13 Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa na mba ọzọ, sitekwa nʼotu alaeze gaa alaeze ọzọ.
PSA 105:14 O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ; ọ baara ndị eze mba nʼihi ha;
PSA 105:15 sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka; unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”
PSA 105:16 O zitere ụnwụ nʼala ahụ, bibie ụzọ niile ha si enweta ihe oriri;
PSA 105:17 o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa nʼihu ha, Josef, onye e refuru dịka ohu.
PSA 105:18 Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ, nyanyekwa ya mkpọrọ igwe nʼolu,
PSA 105:19 tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru, tutu ruo mgbe okwu Onyenwe anyị nwapụtara ya dịka onye eziokwu.
PSA 105:20 Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya, onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya.
PSA 105:21 O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya, onye na-achị ihe niile o nwere,
PSA 105:22 ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya, na izi ndị okenye ya amamihe.
PSA 105:23 Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt; Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa.
PSA 105:24 Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu; o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha,
PSA 105:25 ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị, ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya.
PSA 105:26 O zipụrụ Mosis, ohu ya, na Erọn, onye ọ họpụtara.
PSA 105:27 Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha, ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham.
PSA 105:28 O zipụrụ ọchịchịrị, mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị, nʼihi na ha nupuru isi megide okwu ya.
PSA 105:29 O mere ka mmiri ha niile ghọọ ọbara, nke mere ka azụ niile dị nʼime ya nwụsịa.
PSA 105:30 Ala ha niile jupụtara nʼawọ ọ bụladị nʼime ọnụụlọ ndina nke ndị na-achị achị.
PSA 105:31 O kwuru okwu, igwe ijiji na anwụ nta dị iche iche ejupụta nʼala ha niile.
PSA 105:32 Nʼọnọdụ mmiri ozuzo, o zitere ha mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe nʼala ha niile;
PSA 105:33 o tijisịrị osisi vaịnị na osisi fiig niile ha, kwatusịakwa osisi niile dị nʼala ha.
PSA 105:34 O kwuru okwu, igurube na ụkpana a na-apụghị ịgụta ọnụ jupụtara ebe niile;
PSA 105:35 ha richapụrụ ihe niile bụ ahịhịa ndụ dị nʼala ahụ, ripịakwa mkpụrụ niile ha kụrụ nʼubi ha.
PSA 105:36 Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom ha.
PSA 105:37 Ọ kpọpụtara ụmụ Izrel, ndị chịịrị ọlaọcha na ọlaedo, ọ dịghị otu onye nʼime ebo ya niile nke ahụ na-esighị ike.
PSA 105:38 Obi dị Ijipt ụtọ mgbe ha pụrụ, nʼihi na oke egwu ndị Izrel dakwasịrị ha.
PSA 105:39 Ọ gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi, na ọkụ na-enye ìhè nʼabalị.
PSA 105:40 Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel, jirikwa achịcha si nʼeluigwe nyejuo ha afọ.
PSA 105:41 O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara; ọ sọgharịrị nʼime ọzara dịka iyi.
PSA 105:42 Nʼihi na o chetara nkwa ya dị nsọ, nke o kwere ohu ya Ebraham.
PSA 105:43 O ji aṅụrị dupụta ndị ya, jirikwa ọnọdụ iti mkpu ọṅụ dupụta ndị ya ọ họpụtara;
PSA 105:44 o nyere ha ala niile nke mba dị iche iche, ha ghọrọ ndị nnweta nke ihe ndị ọzọ rụpụta,
PSA 105:45 ka ha nwee ike debe ụkpụrụ ya niile ma na-erubekwa isi nʼiwu ya niile. Toonu Onyenwe anyị.
PSA 106:1 Toonu Onyenwe anyị. Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 106:2 Onye pụrụ ikwupụtasịcha ihe ukwu niile nke Onyenwe anyị na-arụ maọbụ kwupụta otuto ya niile?
PSA 106:3 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi, ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile.
PSA 106:4 O Onyenwe anyị, cheta m mgbe ị ga-egosi ndị gị ihuọma, bịa leta m, mgbe ị na-azọpụta ha,
PSA 106:5 ka m soro keta oke na ngọzị ndị gị ị họpụtara, ka m keta oke nʼọṅụ ahụ dịrị mba gị sorokwa ihe nketa gị nye otuto.
PSA 106:6 Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere; anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume.
PSA 106:7 Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt, ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile; ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile, kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie.
PSA 106:8 Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya, ime ka a mara ike ya dị ukwuu.
PSA 106:9 Ọ baara Osimiri Uhie mba, ọ tachaa; o dufere ndị ya site nʼebe dị omimi gafee dịka ọ bụ ọzara.
PSA 106:10 Ọ zọpụtara ha site nʼaka ndị kpọrọ ha asị; gbapụtakwa ha site nʼaka ndị iro ha.
PSA 106:11 Mmiri ahụ riri ndị iro ha niile; ọ dịghị otu onye nʼime ha fọdụrụ.
PSA 106:12 Mgbe ahụ, ha kweere okwu gị niile, ma bụkuo gị abụ otuto.
PSA 106:13 Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ, ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè.
PSA 106:14 Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha; nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa.
PSA 106:15 Nʼihi ya, o nyere ha ihe ha rịọrọ ya, ma zite ọrịa na-efe efe ka ọ dakwasị ha.
PSA 106:16 Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị.
PSA 106:17 Ala meghere loda Datan, o likwara Abiram, na ndị otù ya.
PSA 106:18 Ọkụ repịara ndị niile sonyere ha; ire ọkụ repịara ndị ajọ omume.
PSA 106:19 Na Horeb, ha kpụrụ nwa ehi, kpọọ isiala nye arụsị e jiri igwe pịa.
PSA 106:20 Ha jiri oyiyi oke ehi nke na-ata ahịhịa gbanwere Ebube ha.
PSA 106:21 Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha, onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt,
PSA 106:22 ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham, na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie.
PSA 106:23 Nʼihi ya, o kwuru na ọ ga-ala ha nʼiyi, ma Mosis, onye ya ọ họpụtara, guzoro nʼetiti ndị ahụ na Chineke, ka oke iwe ya ghara ịla ha nʼiyi.
PSA 106:24 Emesịa, ha ledara ala ọma ahụ anya, ha ekwenyeghị na nkwa ya.
PSA 106:25 Ha tamuru ntamu nʼime ụlọ ikwu ha; ha erubekwaghị isi nye Onyenwe anyị.
PSA 106:26 Nʼihi nke a, o weliri aka ya elu ṅụọrọ ha iyi na ọ ga-eme ka ha niile nwụọ nʼọzara,
PSA 106:27 mee ka agbụrụ ha daa nʼetiti mba dị iche iche, ma chụsasịa ha nʼala niile.
PSA 106:28 Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa, riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja;
PSA 106:29 ha sitere nʼajọ omume ha kpasuo Onyenwe anyị iwe, nke mere ka ọrịa na-efe efe dakwasị ha.
PSA 106:30 Ma Finehaz guzoro ọtọ, mee ihe ziri ezi, ọrịa ahụ na-efe efe kwụsịkwara.
PSA 106:31 A gụnyere nke a dịka ezi omume nye ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
PSA 106:32 Nʼakụkụ mmiri Meriba, ha kpasuru Onyenwe anyị iwe, nʼihi ha, nsogbu dakwasịrị Mosis;
PSA 106:33 nʼihi na ha nupuru isi megide Mmụọ nke Chineke, Mosis kwuru okwu, na-echeghị echiche banyere ihe ọ na-ekwu.
PSA 106:34 Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ dịka Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee.
PSA 106:35 Kama ha gwakọtara onwe ha na mba niile nke ala ahụ, site otu a, mụta ime ka ha na-eme.
PSA 106:36 Ha fere arụsị ha ofufe, nke ghọrọ ihe ịma nʼọnya nye ha.
PSA 106:37 Ha gara nʼihu were ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọrọ chi na-abụghị chi aja.
PSA 106:38 Ha na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọbụla, ọbara ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom, bụ ndị ha chụrụ dịka aja nye arụsị niile nke ala Kenan, si otu a jiri ọbara ha merụọ ala ahụ.
PSA 106:39 Ha sitere nʼihe ha na-eme merụọ onwe ha; site nʼaka ọrụ ha, maka uru ha nyefere onwe ha nʼaka ndị na-emerụ ha.
PSA 106:40 Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị megide ndị ya; ọ gụkwara ihe nketa ya dịka ihe rụrụ arụ.
PSA 106:41 Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche, ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha.
PSA 106:42 Ndị iro ha mekpara ha ahụ chie ha ọnụ nʼala nʼokpuru ike ha.
PSA 106:43 Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha, ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya, bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha.
PSA 106:44 Ma mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ha, ọnọdụ mkpagbu ha metụtara ya;
PSA 106:45 nʼihi ha, o chetara ọgbụgba ndụ ya, sitekwa nʼoke ịhụnanya ya, meere ha ebere.
PSA 106:46 Ọ na-emekwa ka ndị ahụ dọtara ha nʼagha nwee ọmịiko nʼahụ ha.
PSA 106:47 O Onyenwe anyị Chineke anyị, zọpụta anyị, chịkọta anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.
PSA 106:48 Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Ka mmadụ niile sị, “Amen!” Toonu Onyenwe anyị.
PSA 107:1 Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 107:2 Ka ndị niile Onyenwe anyị gbapụtara kwuo otu a, ndị niile ọ gbapụtara site nʼaka onye kpọrọ ha asị,
PSA 107:3 ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche, site nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site nʼugwu na ndịda.
PSA 107:4 Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu, ha enweghị ike ịchọta ụzọ nke ga-eduba ha nʼobodo ebe ha ga-ebi.
PSA 107:5 Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ, olileanya gwụrụ ha nʼobi.
PSA 107:6 Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị, nʼime nsogbu ha, ọ napụtakwara ha site na mkpagbu ha niile.
PSA 107:7 O duuru ha nʼụzọ ziri ezi baa nʼobodo ha ga-ebi.
PSA 107:8 Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,
PSA 107:9 nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ.
PSA 107:10 Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi, ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ na-ata ahụhụ ndị e ji mkpọrọ igwe kee ha agbụ,
PSA 107:11 nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu.
PSA 107:12 Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ, ha sụrụ ngọngọ daa, ma ọ dịghị onye ọbụla nyeere ha aka ibilite ọtọ.
PSA 107:13 Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha, ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ha niile.
PSA 107:14 O mere ka ha site nʼọchịchịrị na oke ihe mwute nke obi pụta. O tijikwara agbụ ha niile.
PSA 107:15 Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,
PSA 107:16 nʼihi na o tijisiela ọnụ ụzọ ama niile e ji bronz kpụọ gbujiekwa mkpọrọ ịkpọchi ụzọ niile e ji igwe kpụọ.
PSA 107:17 Ụfọdụ ghọrọ ndị nzuzu site na nnupu isi taakwa ahụhụ nʼihi njehie ha niile.
PSA 107:18 Ihe oriri ọbụla ghọọrọ ha ihe rụrụ arụ ha bịakwara ọnụ ụzọ ama ọnwụ nso.
PSA 107:19 Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ahụ niile.
PSA 107:20 O zipụrụ okwu ọnụ ya, gwọọ ha; ọ napụtara ha site nʼili.
PSA 107:21 Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
PSA 107:22 Ka ha chụọ aja ekele nye ya jirikwa ọtụtụ abụ ọṅụ kwupụta banyere ọrụ ya niile.
PSA 107:23 Ụfọdụ ji ụgbọ mmiri na-ejegharị nʼelu oke osimiri; ha bụ ndị na-azụ ahịa ma na-ebugharịkwa ngwa ahịa nʼelu oke osimiri.
PSA 107:24 Ha hụrụ ọrụ niile nke Onyenwe anyị, ọtụtụ ọrụ ebube ya nʼogbu mmiri.
PSA 107:25 Nʼihi na o kwuru okwu mere ka oke ifufe kuo nke buliri ebili mmiri elu.
PSA 107:26 Ha bụ ndị e buliri nnọọ ezigbo elu, ma budatakwa ruo ogbu mmiri niile; nʼọnọdụ ihe egwu ahụ, obi lọrọ ha mmiri.
PSA 107:27 Ha na-adagharị, na-aṅagharịkwa dịka ndị ṅụbigara mmanya oke. Mmụta ha banyere ịnya ụgbọ mmiri adịghị enyekwara ha aka nʼoge dị otu a.
PSA 107:28 Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha, o mere ka ha pụta na mkpagbu ahụ niile.
PSA 107:29 O mere ka oke ifufe dere duu; o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ.
PSA 107:30 Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ dajụrụ, o duuru ha ruo ebe ha na-aga nʼudo.
PSA 107:31 Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
PSA 107:32 Ka ha bulie ya elu nʼetiti ọgbakọ ukwu ụmụ mmadụ ma tookwa ya na nzukọ ndị okenye.
PSA 107:33 Ọ na-eme ka iyi ghọọ ọzara; na-emekwa ka ebe mmiri si asọpụta ghọọ ala kpọrọ nkụ.
PSA 107:34 Ọ na-eme ka ala na-amị mkpụrụ hiri nne ghọọ ọzara, nʼihi ajọ omume nke ndị bi nʼime ya.
PSA 107:35 Ọ na-eme ka ọzara ghọọ ala nke ọdọ mmiri jupụtara mee ka ala akọrọ ghọọ isi iyi nke na-asọ asọ;
PSA 107:36 ebe ahụ ka ọ kpọbatara ndị agụụ na-agụ ka ha biri, ebe ahụ ka ha wuru obodo ebe ha ga-ebi.
PSA 107:37 Ha ghara mkpụrụ nʼubi ha dị iche iche, kụọkwa ọtụtụ ubi vaịnị ndị mịrị mkpụrụ dị ukwuu;
PSA 107:38 ọ gọziri ha, ọnụọgụgụ ha bakwara ụba, o mekwara ka anụ ụlọ ha mụbaa.
PSA 107:39 Mgbe ahụ, ọnụọgụgụ ha adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, ha bụ ndị e ji mkpagbu na ihe ndakwasị na iru ụjụ wedata nʼala;
PSA 107:40 onye ahụ na-eleda ndị na-achị achị anya mere ka ha wagharịa nʼọzara, ebe ụzọ na-adịghị.
PSA 107:41 Ma ọ na-anapụta ndị mkpa na-akpa site na nhụju anya ha, mee ka ezinaụlọ ha mụbaa dịka igwe anụ ụlọ.
PSA 107:42 Ndị ezi omume na-ahụ ya na-aṅụrị ọṅụ, ma ndị ajọ omume na-emechi ọnụ ha nọọ duu.
PSA 107:43 Onye ọbụla maara ihe ga-echezi echiche banyere ihe ndị a, ma tuleekwa ọrụ ịhụnanya Onyenwe anyị nke dị ukwuu.
PSA 108:1 Abụ, Abụ Ọma Devid. Obi m dị njikere, o Chineke; aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu.
PSA 108:2 Teta! Ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ.
PSA 108:3 Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.
PSA 108:4 Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
PSA 108:5 Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile, ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
PSA 108:6 Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
PSA 108:7 Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya.
PSA 108:8 Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.
PSA 108:9 Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
PSA 108:10 Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm?
PSA 108:11 Ọ bụghị gị, o Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
PSA 108:12 Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
PSA 108:13 Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
PSA 109:1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma Devid. O Chineke, onye m na-eto, anọgidekwala na-agba nkịtị,
PSA 109:2 nʼihi na ndị ajọ omume na ndị aghụghọ emegheela ọnụ ha megide m; ha aghaala ụgha megide m.
PSA 109:3 Ha na-eji okwu ịkpọ asị gbaa m gburugburu; na-ebuso m agha nʼefu.
PSA 109:4 Nʼọnọdụ ịhụnanya m hụrụ ha, ha na-ebo m ebubo ma abụ m nwoke onye ekpere.
PSA 109:5 Ha ji ihe ọjọọ na-akwụ m ụgwọ ihe ọma m mere, ịkpọ asị nʼọnọdụ ịhụnanya.
PSA 109:6 Họpụta otu onye ajọ omume ka o guzogide ya; ka onye na-ebo ebubo ụgha guzokwa nʼaka nri ya.
PSA 109:7 Mgbe a ga-ekpe ya ikpe, ka ọ bụrụ onye ikpe mara, ka ekpere ya maa ya ikpe ọnwụ.
PSA 109:8 Ka ụbọchị ndụ ya dị ole na ole, ka onye ọzọ nara ya ọkwa ya.
PSA 109:9 Ka ụmụ ya ghọọ ndị na-enweghị nna, ka nwunye ya bụrụ nwanyị na-enweghị di.
PSA 109:10 Ka ụmụ ya ghọọ ndị arịrịọ na-enweghị ebe obibi, ndị e si na mkpọmkpọ ebe ha bi chụpụ.
PSA 109:11 Ka ndị o ji ụgwọ kwakọrọ ihe niile o nwere, ka ndị ọbịa baa bukọrọ ihe niile ọ rụpụtaara onwe ya.
PSA 109:12 Ka onye ọbụla ghara igosi ya obiọma; ka onye ọbụla gharakwa imere ụmụ ya ndị ọ hapụrụ ebere.
PSA 109:13 Kama ka ụmụ ụmụ ya niile nwụsịa, ka a ehichapụkwa aha ha nʼọgbọ nke na-abịa nʼihu.
PSA 109:14 Ka Onyenwe anyị chetakwa mmehie niile nke nna nna ya ha, ka Onyenwe anyị hapụkwa ịgbaghara mmehie nne ya.
PSA 109:15 Ka Onyenwe anyị na-echeta mmehie ha oge niile; ma ka o mee ka ha bụrụ ndị a ga-echefu echefu nʼọgbọ niile.
PSA 109:16 Nʼihi na ọ dịghị mgbe o chere echiche banyere imere onye ọzọ obi ebere, ọ kpagburu ndị ogbenye, ndị nọ na mkpa na ndị obi ha tiwara etiwa ruo nʼọnwụ.
PSA 109:17 Ọ hụrụ ịbụ ndị ọzọ ọnụ nʼanya, ka ọbụbụ ọnụ bịakwasị ya; ọ dịghị atọ ya ụtọ ịgọzi onye ọbụla, ka ngọzị dị anya site nʼebe ọ nọ.
PSA 109:18 O yikwasịrị ịbụ ọnụ dịka uwe ya; ọ bara nʼime ahụ ya dịka mmiri, bakwaa nʼime ọkpụkpụ ya dịka mmanụ.
PSA 109:19 Ka ọ dịịrị ya ka uwe mwụda nke e kere ya gburugburu dịka akwa, dịka belịt e kegidere ya gburugburu ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 109:20 Onyenwe anyị, mee ka nke a bụrụ ụdị ụgwọ ọrụ ndị iro m ga-anata, bụ ndị ahụ niile na-ekwu okwu ọjọọ megide m.
PSA 109:21 Ma gị onwe gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nyere m aka nʼihi aha gị, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, napụta m.
PSA 109:22 Nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa, obi m tiwakwara etiwa nʼime m.
PSA 109:23 Ana m efu dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ dara; adịkwa m ka igurube nke onye m bekwasịrị nʼahụ ya na-efechapụ.
PSA 109:24 Ike agwụla ikpere m, nʼihi ibu ọnụ; ataakwala m ahụ, bụrụ naanị ọkpụkpụ.
PSA 109:25 Aghọọla m onye e ji eme ihe ọchị nye ndị na-ebo m ebubo, mgbe ha hụrụ m, ha na-efufe isi ha.
PSA 109:26 Nyere m aka, o Onyenwe anyị Chineke m; zọpụta m dịka ịhụnanya gị si dị.
PSA 109:27 Ka ha mara na ọ bụ aka gị, na ọ bụ gị, o Onyenwe anyị, mere ya.
PSA 109:28 Ha nwere ike nọgide na-abụ ọnụ, ma ị ga-agọzi; mgbe ha ga-abịa ọgụ, a ga-eme ha ihe ihere, ma ohu gị ga-aṅụrị ọṅụ.
PSA 109:29 A ga-eji ihere yikwasị ndị na-ebo m ebubo dịka uwe werekwa ihere kee ha gburugburu dịka uwe mwụda.
PSA 109:30 Aga m eji ọnụ m jaa Onyenwe anyị mma nke ukwuu; nʼetiti ọha mmadụ dị ukwuu, aga m eto ya.
PSA 109:31 Nʼihi na ọ na-eguzo nʼaka nri nke onye nọ na mkpa, ịzọpụta ya site nʼaka ndị na-ama ya ikpe ọnwụ.
PSA 110:1 Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya: “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.”
PSA 110:2 Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ; ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile.
PSA 110:3 Nʼụbọchị ị ga-ebu agha, ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị. Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe, bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ.
PSA 110:4 Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe uche ya: “Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, nʼusoro Melkizedek.”
PSA 110:5 Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị. Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya.
PSA 110:6 Ọ ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ, ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile.
PSA 110:7 Ọ ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ; nʼihi nke a, ọ ga-eweli isi ya elu.
PSA 111:1 Toonu Onyenwe anyị! Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu.
PSA 111:2 Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha.
PSA 111:3 Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma, ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 111:4 O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko.
PSA 111:5 Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri; ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 111:6 O gosila ndị ya ike nke ọrụ ya niile, site nʼinye ha ala niile nke ndị mba ọzọ.
PSA 111:7 Ọrụ aka ya niile bụ ihe kwesiri ekwesi na ikpe ziri ezi; ụkpụrụ ya niile bụ ihe kwesiri ntụkwasị obi.
PSA 111:8 E hiwere ha ịdị ruo mgbe niile ebighị ebi, ha bụ ihe e mere nʼikwesị ntụkwasị obi na izi ezi.
PSA 111:9 O wetaara ndị ya mgbapụta; o meela ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike ruo ebighị ebi, aha ya dị nsọ dịkwa oke egwu.
PSA 111:10 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe; ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta. Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 112:1 Toonu Onyenwe anyị. Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị; onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile.
PSA 112:2 Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ; ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi.
PSA 112:3 Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 112:4 Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị, nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume.
PSA 112:5 Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe, onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile.
PSA 112:6 Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya; a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 112:7 Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ; obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.
PSA 112:8 Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla; nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri.
PSA 112:9 Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche, ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu.
PSA 112:10 Iwe ga-ewe onye ajọ omume mgbe ọ ga-ahụ ya, ọ ga-atagide ikikere eze tutu ọ nwụọ; olileanya niile nke ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.
PSA 113:1 Toonu Onyenwe anyị! Toonu Onyenwe anyị unu ndị ohu ya. Toonu aha Onyenwe anyị.
PSA 113:2 Ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 113:3 Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya, aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto.
PSA 113:4 Onyenwe anyị dị elu karịa mba niile, ebube ya dị elu karịa eluigwe.
PSA 113:5 Onye dị ka Onyenwe anyị Chineke anyị, onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu,
PSA 113:6 onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ụwa anya?
PSA 113:7 Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elu sitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu;
PSA 113:8 ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ, ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ.
PSA 113:9 Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke ya dịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi. Toonu Onyenwe anyị.
PSA 114:1 Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta,
PSA 114:2 Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke, Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.
PSA 114:3 Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ, osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ;
PSA 114:4 Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule; ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ.
PSA 114:5 Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ? Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ?
PSA 114:6 Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule? Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?
PSA 114:7 Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb,
PSA 114:8 onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri, onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri.
PSA 115:1 Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị, nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị.
PSA 115:2 Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?”
PSA 115:3 Chineke anyị bi nʼeluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme.
PSA 115:4 Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha, ha bụ ọrụ aka mmadụ.
PSA 115:5 Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya abụọ ma ha adịghị ahụ ụzọ;
PSA 115:6 ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ha nwekwara imi ma ha adịghị anụ isisi ọbụla;
PSA 115:7 ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka, ha nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije; ha enweghị ike iji akpịrị ha mee mkpọtụ ọbụla.
PSA 115:8 Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha. Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha.
PSA 115:9 Ụmụ Izrel, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
PSA 115:10 Ezinaụlọ Erọn, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Ọ bụ ya bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
PSA 115:11 Unu ndị na-atụ egwu ya, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
PSA 115:12 Onyenwe anyị na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị, ọ ga-agọzi ndị ya bụ Izrel, ọ ga-agọzi ezinaụlọ Erọn,
PSA 115:13 ọ ga-agọzi ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ma onye nta ma onye ukwu.
PSA 115:14 Ka Onyenwe anyị mee ka unu mụbaa, unu na ụmụ unu.
PSA 115:15 Ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe na elu ụwa gọzie unu.
PSA 115:16 Eluigwe niile bụ nke Onyenwe anyị, ọ bụkwa ya nyere ụmụ mmadụ elu ụwa niile.
PSA 115:17 Ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ na-eto Onyenwe anyị, ndị na-arịda nʼebe ịnọ duu;
PSA 115:18 ọ bụ anyị ga-aja Onyenwe anyị mma, site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Toonu Onyenwe anyị.
PSA 116:1 Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m; ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere.
PSA 116:2 Nʼihi na o gere m ntị, aga m akpọku ya oge ndụ m niile.
PSA 116:3 Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m.
PSA 116:4 Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị: “O Onyenwe anyị, zọpụta m!”
PSA 116:5 Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.
PSA 116:6 Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche; mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.
PSA 116:7 Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m, nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.
PSA 116:8 Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ, anya m site na anya mmiri akwa, napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,
PSA 116:9 ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.
PSA 116:10 Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị, “Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,”
PSA 116:11 nʼime ịda mba m, ekwuru m sị, “Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”
PSA 116:12 Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m?
PSA 116:13 Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
PSA 116:14 Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị.
PSA 116:15 Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị.
PSA 116:16 O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m.
PSA 116:17 Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
PSA 116:18 Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,
PSA 116:19 nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị, nʼetiti gị, O Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị.
PSA 117:1 Toonu Onyenwe anyị, unu mba niile dị iche iche. Jaakwa ya mma, unu ndị niile dị iche iche.
PSA 117:2 Nʼihi na ịhụnanya ya nʼebe anyị nọ dị ukwuu. Ikwesi ntụkwasị obi Onyenwe anyị na-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi. Toonu Onyenwe anyị!
PSA 118:1 Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 118:2 Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
PSA 118:3 Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
PSA 118:4 Ka ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị kwuo sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
PSA 118:5 Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị, ọ zara m, mee ka m nwere onwe m.
PSA 118:6 Onyenwe anyị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?
PSA 118:7 Onyenwe anyị nọnyere m; ọ bụ onye na-enyere m aka. Aga m ele ndị iro m anya na mmeri.
PSA 118:8 Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.
PSA 118:9 Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi.
PSA 118:10 Mba niile gbara m gburugburu ma site nʼaha Onyenwe anyị aga m ala ha nʼiyi.
PSA 118:11 Ha gbara m gburugburu, ma site nʼaha Onyenwe anyị ka m na-egbuda ha.
PSA 118:12 Ha gbara m gburugburu dịka aṅụ, ma e menyụọla ha dịka ogwu na-ere ọkụ; site nʼaha Onyenwe anyị, ka m na-egbuda ha.
PSA 118:13 Akwaghachiri m azụ, agaara m ada, ma Onyenwe anyị nyere m aka.
PSA 118:14 Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m; ọ ghọọla nzọpụta m.
PSA 118:15 Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume: “Aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!
PSA 118:16 Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu; aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!”
PSA 118:17 Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ.
PSA 118:18 Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu, ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ.
PSA 118:19 Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele.
PSA 118:20 Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị, ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye.
PSA 118:21 Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; ị ghọọla nzọpụta m.
PSA 118:22 Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, aghọọla nkume isi ntọala ụlọ;
PSA 118:23 nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị, ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị.
PSA 118:24 Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere, ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.
PSA 118:25 O Onyenwe anyị, zọpụta anyị; o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma.
PSA 118:26 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị.
PSA 118:27 Onyenwe anyị bụ Chineke, ọ bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị. Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke bịaruo nʼebe ịchụ aja.
PSA 118:28 Ị bụ Chineke m, aga m eto gị; ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu.
PSA 118:29 Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 119:1 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu Onyenwe anyị si dị.
PSA 119:2 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.
PSA 119:3 Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile.
PSA 119:4 I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi.
PSA 119:5 Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile!
PSA 119:6 Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile.
PSA 119:7 Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi.
PSA 119:8 Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m.
PSA 119:9 Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.
PSA 119:10 Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.
PSA 119:11 Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị.
PSA 119:12 Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị; kuziere m iwu gị niile.
PSA 119:13 Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa iwu niile nke si nʼọnụ gị.
PSA 119:14 Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba.
PSA 119:15 Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile.
PSA 119:16 Iwu gị na-amasị m; agaghị m elefu okwu gị anya.
PSA 119:17 Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ; aga m erubere okwu gị isi.
PSA 119:18 Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị.
PSA 119:19 Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa; ezonarịla m iwu gị niile.
PSA 119:20 Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile na-agụ mkpụrụobi m agụụ.
PSA 119:21 Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ na ndị na-anaghị agbaso iwu gị.
PSA 119:22 Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị, nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile.
PSA 119:23 Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m, ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị.
PSA 119:24 Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m.
PSA 119:25 Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu; kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị.
PSA 119:26 Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m; ugbu a, kuziere m iwu gị.
PSA 119:27 Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile.
PSA 119:28 Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; gbaa m ume dịka okwu gị si dị.
PSA 119:29 Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile; site nʼiwu gị meere m amara.
PSA 119:30 Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi; e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile.
PSA 119:31 O Onyenwe anyị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike; ekwela ka ihere mee m.
PSA 119:32 Aga m agbaso iwu gị niile nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya.
PSA 119:33 O Onyenwe anyị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ.
PSA 119:34 Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi.
PSA 119:35 Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ.
PSA 119:36 Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe.
PSA 119:37 Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.
PSA 119:38 Mezuo nkwa i kwere ohu gị, ka a tụọ egwu gị.
PSA 119:39 Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.
PSA 119:40 Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! Chebe ndụ m site nʼezi omume gị.
PSA 119:41 O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị;
PSA 119:42 mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị.
PSA 119:43 Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile.
PSA 119:44 Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 119:45 Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.
PSA 119:46 Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze ma ihere agaghị eme m,
PSA 119:47 nʼihi na iwu gị na-amasị m nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya.
PSA 119:48 Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile.
PSA 119:49 Cheta okwu i nyere ohu gị, nʼihi na i nyela m olileanya.
PSA 119:50 Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a: nkwa gị na-echebe ndụ m.
PSA 119:51 Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka, ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m.
PSA 119:52 O Onyenwe anyị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie, ha na-ewetara m nkasiobi.
PSA 119:53 Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume, ndị gbakụtara iwu gị azụ.
PSA 119:54 Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m ebe ọbụla m na-anọ.
PSA 119:55 Nʼabalị, o Onyenwe anyị, ana m echeta aha gị, aga m edebekwa iwu gị.
PSA 119:56 Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile: ana m erubere ụkpụrụ gị isi.
PSA 119:57 O Onyenwe anyị, ị bụ ihe nketa m; ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile.
PSA 119:58 Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị; meere m ebere dịka nkwa gị si dị.
PSA 119:59 Echeela m echiche banyere ụzọ m niile, chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile.
PSA 119:60 Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge irubere iwu gị niile isi.
PSA 119:61 A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ, agaghị m echefu iwu gị.
PSA 119:62 Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele nʼihi iwu gị niile ziri ezi.
PSA 119:63 Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị, ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị.
PSA 119:64 O Onyenwe anyị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị; kuziere m iwu gị niile.
PSA 119:65 Meere ohu gị ihe ọma dịka okwu gị si dị, o Onyenwe anyị.
PSA 119:66 Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile.
PSA 119:67 Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m, ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi.
PSA 119:68 I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi; kuziere m iwu gị niile.
PSA 119:69 Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m, ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị.
PSA 119:70 Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha, ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị.
PSA 119:71 Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile.
PSA 119:72 Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo.
PSA 119:73 Aka gị kere m, kpụọkwa m; nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile.
PSA 119:74 Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị.
PSA 119:75 O Onyenwe anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ.
PSA 119:76 Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, dịka nkwa i kwere ohu gị si dị.
PSA 119:77 Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, nʼihi na iwu gị na-amasị m.
PSA 119:78 Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.
PSA 119:79 Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m, ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile.
PSA 119:80 Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m.
PSA 119:81 Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị.
PSA 119:82 Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?”
PSA 119:83 Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile.
PSA 119:84 Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ?
PSA 119:85 Ndị mpako na-egwuru m olulu, bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị.
PSA 119:86 Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi; nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha.
PSA 119:87 Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi, ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ.
PSA 119:88 Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m, ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị.
PSA 119:89 O Onyenwe anyị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe.
PSA 119:90 Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike.
PSA 119:91 Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi.
PSA 119:92 A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m, agaara m anwụ nʼime nsogbu m.
PSA 119:93 Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m.
PSA 119:94 Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.
PSA 119:95 Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi, ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.
PSA 119:96 Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke, ma iwu gị niile enweghị nsọtụ.
PSA 119:97 O, otu m si hụ iwu gị nʼanya! Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile.
PSA 119:98 Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m, ha na-anọnyere m oge niile.
PSA 119:99 Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe, nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile.
PSA 119:100 Enwere m nghọta karịa ndị okenye nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi.
PSA 119:101 Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla ka m nwee ike rubere okwu gị isi
PSA 119:102 Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha.
PSA 119:103 Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ!
PSA 119:104 A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị.
PSA 119:105 Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.
PSA 119:106 Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile.
PSA 119:107 Ataala m ahụhụ nke ukwuu; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka okwu gị si dị.
PSA 119:108 O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile.
PSA 119:109 Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, ma echezọghị m iwu gị.
PSA 119:110 Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo.
PSA 119:111 Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ.
PSA 119:112 Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha.
PSA 119:113 Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.
PSA 119:114 Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị.
PSA 119:115 Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ, ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m!
PSA 119:116 Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ; ekwekwala ka olileanya m daa.
PSA 119:117 Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara; aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile.
PSA 119:118 Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị, nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi.
PSA 119:119 Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu; nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya.
PSA 119:120 Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile.
PSA 119:121 Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi; ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m.
PSA 119:122 Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya; ekwela ka ndị mpako kpagbuo m.
PSA 119:123 Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi.
PSA 119:124 Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile.
PSA 119:125 Abụ m ohu gị, nye m nghọta, ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile.
PSA 119:126 O Onyenwe anyị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ, nʼihi na a na-emebi iwu gị.
PSA 119:127 Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha,
PSA 119:128 nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi, akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị.
PSA 119:129 Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi.
PSA 119:130 Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.
PSA 119:131 Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike.
PSA 119:132 Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.
PSA 119:133 Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m.
PSA 119:134 Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị.
PSA 119:135 Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile.
PSA 119:136 Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị.
PSA 119:137 O Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, iwu gị niile zikwara ezi.
PSA 119:138 Ụkpụrụ gị niile ziri ezi; ha kwesiri ntụkwasị obi.
PSA 119:139 Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya, ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba.
PSA 119:140 Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma, ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya.
PSA 119:141 Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya, ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya.
PSA 119:142 Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Iwu gị niile bụkwa eziokwu.
PSA 119:143 Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m.
PSA 119:144 Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ.
PSA 119:145 Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o Onyenwe anyị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile.
PSA 119:146 Ana m akpọku gị; zọpụta m aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile.
PSA 119:147 Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka; olileanya m dị nʼokwu gị.
PSA 119:148 Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile.
PSA 119:149 Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka iwu gị niile si dị.
PSA 119:150 Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya.
PSA 119:151 Ma ị nọ nso, Onyenwe anyị; ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu.
PSA 119:152 Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 119:153 Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m, nʼihi na echefughị m iwu gị.
PSA 119:154 Kpepụta m, gbapụta m, chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị.
PSA 119:155 Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile.
PSA 119:156 O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị.
PSA 119:157 Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, ma aga m anọgide na-edebe iwu gị.
PSA 119:158 Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi.
PSA 119:159 Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka ịhụnanya gị si dị.
PSA 119:160 Okwu gị niile bụ eziokwu; iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 119:161 Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere, ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị.
PSA 119:162 Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.
PSA 119:163 Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.
PSA 119:164 Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị, nʼihi iwu gị ziri ezi.
PSA 119:165 Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ.
PSA 119:166 Ana m echere nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, na-agbasokwa iwu gị niile.
PSA 119:167 Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu.
PSA 119:168 Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi, nʼihi na ị maara ụzọ m niile.
PSA 119:169 Ka akwa m ruo gị ntị, o Onyenwe anyị; nye m nghọta dịka okwu gị si dị.
PSA 119:170 Ka arịrịọ m ruo gị ntị; gbapụta m dịka nkwa gị si dị.
PSA 119:171 Ka ọnụ m jupụta nʼotuto, nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile.
PSA 119:172 Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.
PSA 119:173 Nọọ na njikere oge niile inyere m aka, nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile.
PSA 119:174 Ana m ele anya nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, iwu gị bụ ihe na-amasị m.
PSA 119:175 Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị, ka iwu gị niile gbaa m ume.
PSA 119:176 Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu, chọọ ohu gị, nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.
PSA 120:1 Abụ nrigo. Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m, ọ na-azakwa m.
PSA 120:2 O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha na ire na-ekwu okwu aghụghọ.
PSA 120:3 Gịnị ka a ga-eme gị, ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, gị ire aghụghọ?
PSA 120:4 Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ, ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere.
PSA 120:5 Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek, nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda!
PSA 120:6 Ogologo oge ka m binyere ndị kpọrọ udo asị.
PSA 120:7 Abụ m onye udo; ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.
PSA 121:1 Abụ nrigo. Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile, olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?
PSA 121:2 Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa bịa.
PSA 121:3 Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ, onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile;
PSA 121:4 nʼezie onye na-eche Izrel nche adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra.
PSA 121:5 Onyenwe anyị na-eche gị nche, Onyenwe anyị bụ ndo gị nʼaka nri gị;
PSA 121:6 anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie, ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị.
PSA 121:7 Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị. Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile.
PSA 121:8 Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata, site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.
PSA 122:1 Abụ nrigo, nke Devid. Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m, “Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.”
PSA 122:2 Ụkwụ anyị eguzola ugbu a nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem.
PSA 122:3 E wuru Jerusalem dịka obodo a chịkọtara ọnụ nke ọma.
PSA 122:4 Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo, bụ ebo niile nke Onyenwe anyị, ịbụku aha Onyenwe anyị abụ dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị.
PSA 122:5 Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị, bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid.
PSA 122:6 Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem: “Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo.
PSA 122:7 Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niile nchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike.”
PSA 122:8 Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m, ana m ekwu okwu sị, “Udo dịrị gị.”
PSA 122:9 Nʼihi ụlọ Onyenwe anyị, Chineke anyị, aga m achọ ọganihu gị.
PSA 123:1 Abụ nrigo. Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị, gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe.
PSA 123:2 Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya, na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje, otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya, ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere.
PSA 123:3 Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere, nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha.
PSA 123:4 Nʼihi na nnagide anyị na-anagide ịchị ọchị ndị nganga, na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.
PSA 124:1 Abụ nrigo. Nke Devid. A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo,
PSA 124:2 a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,
PSA 124:3 mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ;
PSA 124:4 idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị,
PSA 124:5 ebili mmiri niile gaara ebufu anyị.
PSA 124:6 Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị.
PSA 124:7 Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị.
PSA 124:8 Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa.
PSA 125:1 Abụ nrigo. Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 125:2 Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu, otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 125:3 Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza, nʼihi na ndị ezi omume nwere ike itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ.
PSA 125:4 O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma, ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi.
PSA 125:5 Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ na ndị niile na-eme ajọ ihe. Ka udo dịrị Izrel.
PSA 126:1 Abụ nrigo. Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn, anyị dị ka ndị na-arọ nrọ.
PSA 126:2 Ọchị juru anyị ọnụ, abụ ọṅụ jukwara anyị ire. Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị, “Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.”
PSA 126:3 Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu, obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ.
PSA 126:4 Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị, dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev.
PSA 126:5 Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ.
PSA 126:6 Onye ji ịkwa akwa buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga, ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ, mgbe ha bu ukwu ọka ha.
PSA 127:1 Abụ nrigo, nke Solomọn. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ, ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo, nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.
PSA 127:2 Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ na-adọgbu onwe gị nʼọrụ ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị, nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo.
PSA 127:3 Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị, ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
PSA 127:4 Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha, otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.
PSA 127:5 Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya. Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro na-arụrịta ụka nʼama.
PSA 128:1 Abụ nrigo. Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.
PSA 128:2 Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.
PSA 128:3 Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị.
PSA 128:4 Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị.
PSA 128:5 Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,
PSA 128:6 ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị. Ka udo dịrị Izrel.
PSA 129:1 Abụ nrigo. Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, ka Izrel kwuo.
PSA 129:2 “Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, ma ha enweghị ike merie m.
PSA 129:3 Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi, mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo.
PSA 129:4 Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume; ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.”
PSA 129:5 Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere.
PSA 129:6 Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ nke na-akpọnwụ tupu o pupụta;
PSA 129:7 nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ, maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya.
PSA 129:8 Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha, “Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu. Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị.”
PSA 130:1 Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa.
PSA 130:2 Onyenwe anyị, nụrụ olu m. Ka ntị gị na-aṅakwa ntị nʼolu arịrịọ m, maka amara.
PSA 130:3 O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile, Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo?
PSA 130:4 Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie dị; ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi.
PSA 130:5 Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya, ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị.
PSA 130:6 Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ, e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ.
PSA 130:7 Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide, nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa.
PSA 130:8 Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel site na mmehie ya niile.
PSA 131:1 Abụ nrigo, nke Devid. O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m, ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m; adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m.
PSA 131:2 Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ; dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ, e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m.
PSA 131:3 Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị ugbu a na mgbe niile ebighị ebi.
PSA 132:1 Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, cheta Devid, nʼihe niile bụ ndị ọ gbakụtara azụ.
PSA 132:2 Ọ ṅụrụ iyi nye Onyenwe anyị, kwee nkwa nye Onye dị ukwuu nke Jekọb:
PSA 132:3 “Agaghị m abanye nʼime ụlọ m maọbụ rigoo nʼihe ndina m,
PSA 132:4 agaghị m arahụ ụra, egbugbere anya m agaghị atụ oru ụra,
PSA 132:5 tutu ruo mgbe m chọtaara Onyenwe anyị ọnọdụ ebe obibi nye Onye dị ukwuu nke Jekọb.”
PSA 132:6 Anyị nụrụ ihe banyere ya nʼEfrata, anyị chọtara ya nʼubi niile nke Jearim.
PSA 132:7 “Ka anyị gaa na-ebe obibi ya; ka anyị kpọọ isiala nʼebe ihe mgbakwasị ụkwụ ya.
PSA 132:8 ‘Bilie, Onyenwe anyị, bata nʼebe izuike gị, gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị.
PSA 132:9 Ka ndị nchụaja gị yiri ezi omume gị dịka uwe; ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi bụọ abụ nʼihi ọṅụ.’ ”
PSA 132:10 Nʼihi ohu gị, bụ Devid, agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ.
PSA 132:11 Onyenwe anyị ṅụrụ Devid iyi nʼeziokwu, bụ iyi nke ọ gaghị esi na ya laghachi azụ: “Otu nʼime ụmụ gị, ka m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị,
PSA 132:12 ọ bụrụ na ụmụ ndị ikom gị edebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ niile m kuziri ha, mgbe ahụ ụmụ ha ga-anọdụ ala nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.”
PSA 132:13 Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn, ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya;
PSA 132:14 “Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi, ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ.
PSA 132:15 Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya; aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya.
PSA 132:16 Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe, ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ.
PSA 132:17 “Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi puputara Devid ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ.
PSA 132:18 Aga m eyikwasị ndị iro ya ihere dịka uwe ma aga eji okpueze mara mma chọọ isi ya mma.”
PSA 133:1 Abụ nrigo, nke Devid. Lee ka o si bụrụ ihe dị mma na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!
PSA 133:2 Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ, e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn, ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.
PSA 133:3 Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn. Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya, ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 134:1 Abụ nrigo. Toonu Onyenwe anyị, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị nʼoge abalị.
PSA 134:2 Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya ma toonu Onyenwe anyị.
PSA 134:3 Ka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa site na Zayọn gọzie unu.
PSA 135:1 Toonu Onyenwe anyị. Toonu aha Onyenwe anyị, toonu ya, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile,
PSA 135:2 unu ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị, nʼime ogige ụlọ Chineke anyị.
PSA 135:3 Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị dị mma; bụkuo aha ya abụ otuto, nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi.
PSA 135:4 Nʼihi na Onyenwe anyị ahọpụtala Jekọb nye onwe ya, ọ họpụtala Izrel ka ọ bụrụ ihe oke ọnụahịa nke aka ya.
PSA 135:5 Amaara m na Onyenwe anyị dị ukwuu, na Onyenwe anyị dị ukwuu karịa chi niile.
PSA 135:6 Onyenwe anyị na-eme ihe ọbụla masịrị ya nʼeluigwe na elu ụwa na nʼoke osimiri na nʼime ogbu mmiri niile.
PSA 135:7 Ọ bụ ya na-eme ka igwe ojii na-apụta site nʼakụkụ niile nke ụwa. Ọ bụkwa ya na-ezite amụma nke na-eweta mmiri ozuzo. Ọ na-ewepụtakwa ifufe site nʼụlọ ifufe ya niile.
PSA 135:8 O tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ụmụ mmadụ buru ụzọ mụọ na ụmụ anụ ụlọ e buru ụzọ mụọ.
PSA 135:9 O zipụrụ ihe ịrịbama ya dị iche iche na ọrụ ebube ya niile nʼetiti unu, o Ijipt, megide Fero na ndị niile na-ejere ya ozi.
PSA 135:10 O tigburu ọtụtụ mba dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, tigbukwaa ndị eze ha, ndị dị ike nʼagha.
PSA 135:11 Ụfọdụ nʼime ha bụ Saịhọn, eze ndị Amọrait, na Ọg eze Bashan, na ndị eze niile dị na Kenan.
PSA 135:12 O weere ala ndị obodo ahụ niile nye ndị ya, nye ya ụmụ Izrel dịka ihe nketa ha.
PSA 135:13 O Onyenwe anyị, aha gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi a maara aha gị ruo ọgbọ niile.
PSA 135:14 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekpepụta ndị ya. Ọ ga-enwekwa ọmịiko nʼahụ ndị ohu ya.
PSA 135:15 Chi ndị mba ọzọ bụ arụsị e jiri aka kpụọ, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ.
PSA 135:16 Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ.
PSA 135:17 Ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ọ dịkwaghị nkuume dị nʼime ọnụ ha.
PSA 135:18 Ndị na-eme ha ga-adị ka ha. Ọ bụkwa otu a ka ndị na-atụkwasị ha obi ga-adị.
PSA 135:19 Ndị Izrel, toonu Onyenwe anyị. Unu ndị ụlọ Erọn, toonu Onyenwe anyị.
PSA 135:20 Unu ndị ụlọ Livayị, toonu Onyenwe anyị; unu ndị na-atụ egwu ya, toonu Onyenwe anyị.
PSA 135:21 Ka otuto dịrị Onyenwe anyị site na Zayọn, nye onye ahụ na-ebi na Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị.
PSA 136:1 Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma.
PSA 136:2 Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu.
PSA 136:3 Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.
PSA 136:4 Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche,
PSA 136:5 Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile,
PSA 136:6 Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri,
PSA 136:7 Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa,
PSA 136:8 Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie,
PSA 136:9 Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị,
PSA 136:10 Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt,
PSA 136:11 O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta,
PSA 136:12 O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha;
PSA 136:13 Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ,
PSA 136:14 Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya,
PSA 136:15 Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile;
PSA 136:16 Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara,
PSA 136:17 Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu,
PSA 136:18 O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu,
PSA 136:19 O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait,
PSA 136:20 Na Ọg eze Bashan,
PSA 136:21 Were ala ha nye dịka ihe nketa,
PSA 136:22 O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha,
PSA 136:23 Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike,
PSA 136:24 Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị,
PSA 136:25 Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri,
PSA 136:26 Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele.
PSA 137:1 Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa mgbe anyị chetara Zayọn.
PSA 137:2 Ọ bụ nʼosisi pọpla ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile.
PSA 137:3 Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ, ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ; ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!”
PSA 137:4 Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị ebe anyị nọ nʼala ọzọ?
PSA 137:5 Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem, ka aka nri m chefuo ǹka ya.
PSA 137:6 Ọ bụrụ na m echezọọ gị, ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche banyere Jerusalem, oke ọṅụ m, ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.
PSA 137:7 Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha. “Tikpọsịa ya,” ka ha tiri, “Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!”
PSA 137:8 Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi, ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị nʼihi ihe i mere anyị,
PSA 137:9 onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara tụpịa ha nʼelu nkume.
PSA 138:1 Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị; nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto.
PSA 138:2 Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị aga m etokwa aha gị nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị dị elu karịa ihe niile.
PSA 138:3 Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m; i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike.
PSA 138:4 O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị, mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu.
PSA 138:5 Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị, nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu.
PSA 138:6 Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya, ma ọ naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso.
PSA 138:7 A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu, ị na-echebe ndụ m; ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị, ị na-eji aka nri gị zọpụta m.
PSA 138:8 Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m; ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ahapụkwala ọrụ aka gị niile.
PSA 139:1 Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma
PSA 139:2 Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.
PSA 139:3 Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile.
PSA 139:4 O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya.
PSA 139:5 Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ, ị tụkwasịla m aka gị.
PSA 139:6 Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m, ọ dịkwa elu apụghị m iru ya.
PSA 139:7 Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị? Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m?
PSA 139:8 Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ.
PSA 139:9 Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri,
PSA 139:10 ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m aka nri gị ga-ejidesi m ike.
PSA 139:11 Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.”
PSA 139:12 Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ; abalị ga-enye ìhè dịka ehihie, nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.
PSA 139:13 Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.
PSA 139:14 Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.
PSA 139:15 Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.
PSA 139:16 Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị.
PSA 139:17 Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke! Leekwa ka ha si dị ukwuu.
PSA 139:18 Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ, ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala. Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.
PSA 139:19 O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi! Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara!
PSA 139:20 Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị; ndị iro gị na-ekwutọ aha gị.
PSA 139:21 O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị, na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi?
PSA 139:22 Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ? Ana m agụnye ha dịka ndị iro m.
PSA 139:23 O Chineke, nyochaa m, mara obi m. Nwaa m, matakwa echiche uche m niile.
PSA 139:24 Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m, ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.
PSA 140:1 Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ. Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche.
PSA 140:2 Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha na-akpali agha ụbọchị niile.
PSA 140:3 Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ; elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Sela
PSA 140:4 Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu; chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị na-eche echiche ọdịda m.
PSA 140:5 Ndị mpako esielera m ọnya igbudu; ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha, siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. Sela
PSA 140:6 A sịrị m Onyenwe anyị, “Gị onwe gị bụ Chineke m.” Nụrụ, O Onyenwe anyị, olu arịrịọ m maka amara.
PSA 140:7 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike, ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha.
PSA 140:8 Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị, ekwekwala ka nzube ha mezuo. Sela
PSA 140:9 Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha.
PSA 140:10 Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha; ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere, nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ.
PSA 140:11 Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala, ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike.
PSA 140:12 Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha.
PSA 140:13 Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị, ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.
PSA 141:1 Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ. Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị.
PSA 141:2 Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ; ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị.
PSA 141:3 Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị; na-echekwa egbugbere ọnụ m nche.
PSA 141:4 Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ, isonye ndị na-eme ihe ọjọọ rụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche; ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile.
PSA 141:5 Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere; ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m. Isi m agaghị ajụ ya. Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ.
PSA 141:6 A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha, mgbe ahụ, ndị ajọ omume ga-amata na okwu m niile bụ eziokwu.
PSA 141:7 Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala, otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.”
PSA 141:8 Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼime gị ka m gbabara izere ndụ, ararala m nyefee nʼaka ọnwụ.
PSA 141:9 Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri, sitekwa nʼọnya niile ha siiri m.
PSA 141:10 Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha, ma mụ onwe m ga-agabiga na-emerụghị ahụ ọbụla.
PSA 142:1 Abụ maskil nke Devid. Mgbe ọ nọ nʼọgba nkume. Ekpere. Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa; ewelitara m olu m rịọ Onyenwe anyị ka o meere m ebere.
PSA 142:2 Ekwupụtara m ihe na-esogbu m nʼihu ya, gwakwa ya ahụhụ nke m nọ nʼime ya.
PSA 142:3 Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m, ọ bụ gị maara ụzọ m. Nʼụzọ ebe m na-esi aga ka ndị mmadụ siiri m ọnya.
PSA 142:4 Lee anya nʼaka nri m ma hụ na ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m. Enweghị m ebe mgbaba. Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi.
PSA 142:5 Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị, na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m, oke m nʼala ndị dị ndụ.”
PSA 142:6 Gee ntị na mkpu akwa m, nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike; gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ, nʼihi na ha siri ike karịa m.
PSA 142:7 Mee ka m nwere onwe m site nʼụlọ mkpọrọ, ka m nwee ike too aha gị. Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-agba m gburugburu nʼihi ịdị mma gị nʼebe m nọ.
PSA 143:1 Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka amara; nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị na ezi omume gị, bịa nyere m aka.
PSA 143:2 Edubatala m nʼọnọdụ ikpe m ikpe, nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla dị ndụ bụ onye ezi omume nʼihu gị.
PSA 143:3 Onye iro na-achụ m ọsọ, ọ na-azọpịa ndụ m nʼala; na-emekwa ka m nọdụ nʼọchịchịrị, dịka ndị nwụrụ anwụ nʼogologo oge gara aga.
PSA 143:4 Ya mere mmụọ m na-ada mba nʼime m ụjọ jupụtakwara m nʼobi.
PSA 143:5 Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga; ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niile na-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ.
PSA 143:6 Ana m agbasa aka m abụọ nye gị; agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. Sela
PSA 143:7 O Onyenwe anyị, zaa m ọsịịsọ; mmụọ m na-ada mba. Ezonarịla m ihu gị, ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili.
PSA 143:8 Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ, nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi. Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso, nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye.
PSA 143:9 O Onyenwe anyị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m, nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m.
PSA 143:10 Kuziere m ime uche gị, nʼihi na ị bụ Chineke m; ka ezi Mmụọ gị duo m nʼala dị larịị.
PSA 143:11 O Onyenwe anyị, nʼihi aha gị chebe ndụ m; nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu.
PSA 143:12 Nʼime ịhụnanya gị na-adịghị agharịpụ, kpochapụ ndị iro m; laa ndị niile kpọrọ m asị nʼiyi, nʼihi na abụ m ohu gị.
PSA 144:1 Abụ Ọma nke Devid. Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m, onye na-ezi aka m abụọ ibu agha, na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ.
PSA 144:2 Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m, ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya, onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m.
PSA 144:3 O Onyenwe anyị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya, gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi?
PSA 144:4 Mmadụ dị ka otu nkuume; ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo.
PSA 144:5 O Onyenwe anyị, kewaa eluigwe rịdata; metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.
PSA 144:6 Zipụ amụma ka o chụsasịa ndị iro niile; gbaa ha àkụ gị niile ma chụsasịa ha.
PSA 144:7 Site nʼelu setịpụ aka gị; gbapụta m, napụtakwa m site nʼoke osimiri, site nʼaka ndị si mba ọzọ,
PSA 144:8 ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.
PSA 144:9 O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ. Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu;
PSA 144:10 gị onye na-enye ndị eze mmeri, onye na-agbapụta ohu ya Devid. Site na mma agha dị njọ
PSA 144:11 gbapụta m; napụtakwa m site nʼaka ndị si mba ọzọ ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.
PSA 144:12 Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha, ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma, ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị e ji achọ ụlọeze mma.
PSA 144:13 Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriri dị iche iche si nʼubi anyị. Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ, ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị;
PSA 144:14 igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ. A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile, a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ, akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile.
PSA 144:15 Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị; ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha.
PSA 145:1 Abụ Ọma otuto, nke Devid. Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze; aga m eto aha gị, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
PSA 145:2 Ụbọchị niile ka m ga-eto gị jaakwa aha gị mma site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
PSA 145:3 Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta.
PSA 145:4 Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ; ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.
PSA 145:5 Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị, aga m atụgharịkwa uche nʼọrụ ebube gị niile.
PSA 145:6 Ha ga-ekwupụta ihe banyere ike nke ọrụ ịtụnanya gị niile, aga m ekwusakwa ọrụ ukwuu gị niile.
PSA 145:7 Ha ga-eme mmemme nʼihi ịdị mma gị dị ukwuu jirikwa ọṅụ bụọ abụ banyere ezi omume gị.
PSA 145:8 Onyenwe anyị na-eme amara nweekwa obi ọmịiko, ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, ọ bara ụba nʼịhụnanya.
PSA 145:9 Onyenwe anyị dị mma nʼebe mmadụ niile dị; o nwere ọmịiko nʼebe ihe niile o kere eke dị.
PSA 145:10 O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma.
PSA 145:11 Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị,
PSA 145:12 ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị.
PSA 145:13 Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
PSA 145:14 Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada na-akwagide ndị niile dara mba.
PSA 145:15 Olileanya ihe niile dị na gị, ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru.
PSA 145:16 I na-asaghepụ aka gị na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ.
PSA 145:17 Ụzọ Onyenwe anyị niile ziri ezi; ọ na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
PSA 145:18 Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.
PSA 145:19 Ọ na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya; ọ na-anụ akwa ha na-azọpụtakwa ha.
PSA 145:20 Onyenwe anyị na-echebe ndị niile hụrụ ya nʼanya, ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi.
PSA 145:21 Ọnụ m ga-ekwupụta otuto Onyenwe anyị; ka ihe niile e kere eke too aha nsọ ya ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 146:1 Toonu Onyenwe anyị. O mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
PSA 146:2 Aga m eto Onyenwe anyị ogologo ndụ m niile; aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ.
PSA 146:3 Atụkwasịla ụmụ eze obi gị, ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta.
PSA 146:4 Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja; nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu.
PSA 146:5 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb, onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya.
PSA 146:6 Onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha, Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
PSA 146:7 Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri. Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha,
PSA 146:8 Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì, Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba, Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya.
PSA 146:9 Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa, na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ, ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma.
PSA 146:10 Onyenwe anyị na-achị ruo ebighị ebi, Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Toonu Onyenwe anyị.
PSA 147:1 Toonu Onyenwe anyị! Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto. Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya!
PSA 147:2 Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem: ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ.
PSA 147:3 Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.
PSA 147:4 Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile na-akpọkwa ha nʼotu na otu.
PSA 147:5 Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu; nghọta ya enweghị nsọtụ.
PSA 147:6 Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala.
PSA 147:7 Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ; jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu.
PSA 147:8 Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe; ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile.
PSA 147:9 Ọ na-enye ehi niile nri na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri.
PSA 147:10 Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya, maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ.
PSA 147:11 Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.
PSA 147:12 O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma; o Zayọn, too Chineke gị.
PSA 147:13 Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike, na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị.
PSA 147:14 Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo, jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ.
PSA 147:15 Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa.
PSA 147:16 Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ, na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ.
PSA 147:17 Ọ na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute. Onye pụrụ iguzogide oke ifufe oyi ya?
PSA 147:18 Ọ na-ezipụ okwu ya na-agbaze ha; ọ na-akpalịte ikuku ya mee ka mmiri bido ịsọgharị.
PSA 147:19 O kpugheela okwu ya nye Jekọb, iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel.
PSA 147:20 O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a. Ha amakwaghị iwu ya niile. Toonu Onyenwe anyị!
PSA 148:1 Toonu Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị site nʼeluigwe, toonu ya nʼebe niile kachasị elu.
PSA 148:2 Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile.
PSA 148:3 Toonu ya, anyanwụ na ọnwa toonu ya, kpakpando niile.
PSA 148:4 Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe.
PSA 148:5 Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya.
PSA 148:6 O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi; o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga.
PSA 148:7 Toonu Onyenwe anyị, site nʼụwa, unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile,
PSA 148:8 na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile, na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu,
PSA 148:9 unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile
PSA 148:10 na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile, na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile,
PSA 148:11 ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa,
PSA 148:12 ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, ndị okenye na ụmụntakịrị.
PSA 148:13 Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa.
PSA 148:14 O meela ka mpi ndị ya dị elu, otuto ndị nsọ ya niile, nke Izrel ndị ọ hụrụ nʼanya. Toonu Onyenwe anyị.
PSA 149:1 Toonu Onyenwe anyị! Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ. Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.
PSA 149:2 Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha; ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha.
PSA 149:3 Ka ha jiri ite egwu too aha ya ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.
PSA 149:4 Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ. Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze.
PSA 149:5 Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a, bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha.
PSA 149:6 Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha, ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha,
PSA 149:7 iji bọọrọ mba niile ọbọ taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ,
PSA 149:8 iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe,
PSA 149:9 imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha. Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya. Toonu Onyenwe anyị.
PSA 150:1 Toonu Onyenwe anyị. Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya. Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.
PSA 150:2 Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya. Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.
PSA 150:3 Werenụ opi ike too ya, werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,
PSA 150:4 jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,
PSA 150:5 werenụ ogene too ya, werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.
PSA 150:6 Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị.
PRO 1:1 Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel.
PRO 1:2 Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka, maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma,
PRO 1:3 nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche, ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị.
PRO 1:4 Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche, ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.
PRO 1:5 Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara, ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.
PRO 1:6 Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile na-esi nʼọnụ ndị maara ihe.
PRO 1:7 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma. Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.
PRO 1:8 Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
PRO 1:9 Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
PRO 1:10 Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra, ekwenyerela ha, Ekwela!
PRO 1:11 Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị, tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ, bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.
PRO 1:12 Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili, loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu.
PRO 1:13 Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa, nke anyị ga-akwaju nʼụlọ anyị.
PRO 1:14 Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị, ihe ọbụla kwa anyị nwetara, anyị na gị ga-ekekọta ya ọnụ.”
PRO 1:15 Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a, a zọọkwala ụkwụ nʼokporoụzọ ha;
PRO 1:16 nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ, na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara.
PRO 1:17 Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ, nʼebe nnụnụ ọbụla na-ahụ ya anya.
PRO 1:18 Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha. Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide.
PRO 1:19 Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi. Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ.
PRO 1:20 Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ. Olu ya na-ada ụda nʼama.
PRO 1:21 Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku, nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile.
PRO 1:22 “Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya? Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo? Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị?
PRO 1:23 Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu, aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu, aga m emekwa ka unu mara okwu m.
PRO 1:24 Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku, setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị,
PRO 1:25 ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị, jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu,
PRO 1:26 ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị. Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo.
PRO 1:27 Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike, mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe, mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya.
PRO 1:28 “Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m. Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m.
PRO 1:29 Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị, unu atụghị egwu Onyenwe anyị.
PRO 1:30 Unu aṅaghị ntị na ndụmọdụ m. Unu lelịrị ịba mba m anya.
PRO 1:31 Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta. Ọ bụkwa ụzọ unu na ndụmọdụ unu ga-eju unu afọ.
PRO 1:32 Nʼihi na ejezighị ije nke ndị na-enweghị uche na-egbu ha, ọ bụkwa ọnọdụ afọ ojuju ndị nzuzu ga-alakwa ha nʼiyi.
PRO 1:33 Ma onye na-ege ntị nʼokwu m ga-ebi obi ntụkwasị obi. Ọ ga-anọ jụụ na-enweghị ihe ọbụla ga-atụ ya egwu.”
PRO 2:1 Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile zobekwa iwu m niile nʼime obi gị,
PRO 2:2 tọọ ntị gị nʼala nye amamihe, wepụta obi gị inwe nghọta.
PRO 2:3 E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị,
PRO 2:4 ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha maọbụ akụ nke zoro ezo,
PRO 2:5 mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke.
PRO 2:6 Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.
PRO 2:7 Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke.
PRO 2:8 Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso.
PRO 2:9 Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi na ihe dị mma na ezi ụzọ niile.
PRO 2:10 Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ.
PRO 2:11 Izuzu zuruoke ga-echebe gị, nghọta ga na-eche gị nche.
PRO 2:12 Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie, sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ,
PRO 2:13 ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị,
PRO 2:14 ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ.
PRO 2:15 Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ, jọọkwa njọ.
PRO 2:16 Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna, na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu.
PRO 2:17 Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ, nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke.
PRO 2:18 Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ.
PRO 2:19 Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi. Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ.
PRO 2:20 Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume, debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume,
PRO 2:21 nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ, ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya.
PRO 2:22 Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ, ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.
PRO 3:1 Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. Ma debe iwu m nʼobi gị.
PRO 3:2 Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu.
PRO 3:3 Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
PRO 3:4 Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ.
PRO 3:5 Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị.
PRO 3:6 Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
PRO 3:7 A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
PRO 3:8 Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.
PRO 3:9 Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị.
PRO 3:10 Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ.
PRO 3:11 Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya.
PRO 3:12 Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.
PRO 3:13 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta.
PRO 3:14 Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo.
PRO 3:15 Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya.
PRO 3:16 Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa.
PRO 3:17 Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo.
PRO 3:18 Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka, e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma.
PRO 3:19 Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa; ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị.
PRO 3:20 Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile, igwe ojii na-atụdakwa igirigi.
PRO 3:21 Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha: amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke,
PRO 3:22 nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị.
PRO 3:23 Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ.
PRO 3:24 Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ.
PRO 3:25 Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume.
PRO 3:26 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị, ọ ga-echebekwa gị.
PRO 3:27 Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.
PRO 3:28 A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa.
PRO 3:29 Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị, nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ.
PRO 3:30 Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi, mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla.
PRO 3:31 Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla.
PRO 3:32 Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma.
PRO 3:33 Ọbụbụ ọnụ Onyenwe anyị dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume, ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume.
PRO 3:34 Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo, ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara.
PRO 3:35 Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ, ma ndị nzuzu na-enweta ihere.
PRO 4:1 Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu, lezienụ anya ka unu nwee nghọta.
PRO 4:2 Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu; ya mere, unu ahapụkwala iwu m.
PRO 4:3 Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m, mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji,
PRO 4:4 ọ ziri m ihe, sịkwa m, “Ka obi gị jidesie okwu m niile ike, debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.
PRO 4:5 Nweta amamihe, nwetakwa nghọta, echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị.
PRO 4:6 Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị, hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.
PRO 4:7 Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe, ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.
PRO 4:8 Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu. Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ.
PRO 4:9 Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.”
PRO 4:10 Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị; ị ga-enwekwa ndụ ogologo.
PRO 4:11 M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.
PRO 4:12 Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ.
PRO 4:13 Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha, nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke.
PRO 4:14 Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha.
PRO 4:15 Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha; chepu ihu gị nʼụzọ ahụ,
PRO 4:16 nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ. Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya.
PRO 4:17 Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ nke ọgbaaghara.
PRO 4:18 Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ, nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị.
PRO 4:19 Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị, ha anaghị ama ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.
PRO 4:20 Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu. Gee ntị nke ọma.
PRO 4:21 Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile; ka ha bamiekwa nʼime obi gị,
PRO 4:22 nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha, bụrụkwa ahụ ike nye mmadụ.
PRO 4:23 Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya, nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.
PRO 4:24 Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta; kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị.
PRO 4:25 Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu; atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla.
PRO 4:26 Leruo ije ụkwụ gị anya, doziekwa ụzọ gị niile ka ọ guzozie.
PRO 4:27 Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe; si nʼihe ọjọọ wezuga ụkwụ gị.
PRO 5:1 Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m, gee ntị nʼokwu nghọta m ndị a.
PRO 5:2 Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche, ka egbugbere ọnụ gị na-echebekwa ihe ọmụma.
PRO 5:3 Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ, okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.
PRO 5:4 Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.
PRO 5:5 Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ, nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ.
PRO 5:6 Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ; ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a.
PRO 5:7 Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị, unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu.
PRO 5:8 Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ! Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,
PRO 5:9 ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ, maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.
PRO 5:10 Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị, ka ihe niile ị dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ.
PRO 5:11 Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ mgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị.
PRO 5:12 Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị! “Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya!
PRO 5:13 Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m maọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m.
PRO 5:14 Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi nʼihu ọha mmadụ niile.”
PRO 5:15 Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị; mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị.
PRO 5:16 Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ, ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama?
PRO 5:17 Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị, nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya.
PRO 5:18 Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị; ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị.
PRO 5:19 Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma, ka ara dị ya nʼobi zuore gị, ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.
PRO 5:20 Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko? Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?
PRO 5:21 Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya, ihe niile ị na-eme ka ọ na-ahụ.
PRO 5:22 Onye na-emebi iwu na-esite na mmehie ya laa onwe ya nʼiyi; mmehie ndị a bụ ụdọ nke na-ejide ya.
PRO 5:23 Ọ ga-anwụ nʼihi na ọ nabataghị ịdọ aka na ntị; ọ bụkwa nzuzu ya dufuru ya.
PRO 6:1 Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe, ọ bụrụ na ị nara aka ị bụrụ onye ọbịa onye akaebe,
PRO 6:2 ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru, onye enwudere site nʼokwu ọnụ ya.
PRO 6:3 Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị; nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị: Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya enyekwala ya izuike ọbụla.
PRO 6:4 Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ, ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra.
PRO 6:5 Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta, maọbụ dịka nnụnụ site nʼọnya osi ọnya.
PRO 6:6 Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ. Mụta ihe site nʼụzọ ya niile.
PRO 6:7 Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha, maọbụ onyendu, maọbụ ọchịagha,
PRO 6:8 ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị ma na-ewebata nri ya nʼoge owuwe ihe ubi.
PRO 6:9 Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ? Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie?
PRO 6:10 Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike,
PRO 6:11 ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.
PRO 6:12 Onye okwu na ụka na onye omume ya jọgburu onwe ya, onye na-ejegharị na-ekwu okwu aghụghọ,
PRO 6:13 onye ji iro na-egbu ikuanya ya, jiri ụkwụ ya na-ekwu okwu na mkpịsịaka ya na-egosi ihe.
PRO 6:14 Onye obi ya na-echepụta ihe ọjọọ na aghụghọ, onye na-akpalikwa esemokwu mgbe niile.
PRO 6:15 Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede; nʼotu ntabi anya ka a ga-ebibi ya, apụghịkwa ịgwọta ya.
PRO 6:16 Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị, e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
PRO 6:17 Anya dị nganga, ire na-ekwu okwu ụgha, aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ.
PRO 6:18 Obi na-echepụta nzube ọjọọ; ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe,
PRO 6:19 onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna.
PRO 6:20 Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu, ahapụkwala iwu nke nne gị.
PRO 6:21 Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile, ka ị ghara ichefu ha.
PRO 6:22 Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị; mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị. Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka.
PRO 6:23 Nʼihi na iwu a bụ oriọna, Ihe ozizi a bụkwa ìhè, otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba bụ ụzọ ezi ndụ,
PRO 6:24 idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ, sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ.
PRO 6:25 Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya, ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị.
PRO 6:26 Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta, ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi.
PRO 6:27 Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya, ma uwe ya ereghị ọkụ?
PRO 6:28 Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ?
PRO 6:29 Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya; o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ.
PRO 6:30 Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohi ka o were gboo mkpa agụụ nke na-agụsị ya ike.
PRO 6:31 Ma ọ bụrụ na ejide ya ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe niile ahụ o zuru okpukpu asaa. Nʼagbanyeghị na nke a ga-eme ka o ree ihe niile o ji biri nʼụlọ ya.
PRO 6:32 Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya, nʼihi na ọ bụ onwe ya ka ọ na-ala nʼiyi.
PRO 6:33 A ga-eti ya ezi ihe otiti, a ga-elelikwa ya anya, ihere ya agaghị ekwe ihichapụ.
PRO 6:34 Nʼihi na di nwanyị ahụ ga-esite nʼekworo wee iwe dị ọkụ; ọ gakwaghị enwe obi ebere nʼebe ọ nọ nʼụbọchị ọ ga-abọ ọbọ.
PRO 6:35 Ọ gaghị anara ihe ọbụla nʼọnọdụ ihe nkwụghachi nʼihi ihe ọjọọ o mere ya. O nwekwaghị ihe a ga-enye ya pụrụ ime ka iwe ya dajụọ.
PRO 7:1 Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya, dokwaa iwu m niile nʼime obi gị.
PRO 7:2 Debe iwu m ka ị dị ndụ, chee ozizi m nche dịka ọ bụ mkpụrụ anya gị.
PRO 7:3 Kee ha na mkpịsịaka gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
PRO 7:4 Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya; hụkwa inwe nghọta nʼanya dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne gị.
PRO 7:5 Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko, ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya.
PRO 7:6 Nʼihi na otu ụbọchị, esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya,
PRO 7:7 hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche, ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha, onye amamihe kọrọ,
PRO 7:8 ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ nʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme,
PRO 7:9 nʼoge anyasị, dịka chi na-eji, mgbe ọchịchịrị na-agbachi.
PRO 7:10 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya. O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya.
PRO 7:11 (Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla. Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya.
PRO 7:12 Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama; na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.)
PRO 7:13 O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ, were ihu nke ihere na-adịghị, sị:
PRO 7:14 “Emezuru m nkwa niile m kwere taa, enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m,
PRO 7:15 Ọ bụ gị ka m na-achọkwute, lee gị ka ị na-abịa.
PRO 7:16 Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa.
PRO 7:17 Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn nʼelu nʼihe ndina m.
PRO 7:18 Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi.
PRO 7:19 Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya.
PRO 7:20 O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.”
PRO 7:21 Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya. O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ.
PRO 7:22 O sooro nwanyị ahụ dịka ehi a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya, dịka ele nke na-aba nʼọnya,
PRO 7:23 nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi. Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya.
PRO 7:24 Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị, kama meekwanụ ihe m na-ekwu.
PRO 7:25 Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị; ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị.
PRO 7:26 Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ, ọtụtụ mmadụ amaala nʼọnya ya.
PRO 7:27 Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili, nke na-edubakwa nʼala ọnwụ.
PRO 8:1 Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu? Ọ bụ na nghọta anaghị eme ka olu ya daa ụda?
PRO 8:2 Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ, nʼagbata ụzọ niile.
PRO 8:3 Nʼọnụ ụzọ nke obodo niile na nʼọnụ ụzọ ụlọ niile ka ọ nọ na-eti mkpu,
PRO 8:4 ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị; ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu.
PRO 8:5 Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke; unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta.
PRO 8:6 Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu; Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi,
PRO 8:7 Ọnụ m na-ekwu eziokwu nʼihi na akpọrọ m okwu ụgha asị.
PRO 8:8 Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya.
PRO 8:9 Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya; nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi.
PRO 8:10 Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha họrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma.”
PRO 8:11 Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya.
PRO 8:12 “Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta. Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu.
PRO 8:13 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Akpọrọ m nganga na mpako, omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.
PRO 8:14 Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m; enwekwara m ọmụma ihe na ike.
PRO 8:15 Site na m ka ndị eze ji achị, ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi.
PRO 8:16 Site na m ka ndị eze ji achị bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa.
PRO 8:17 Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m.
PRO 8:18 Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ, na ikpe ziri ezi na ezi omume.
PRO 8:19 Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha, ọ karịkwara ọlaedo.
PRO 8:20 Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume, nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi.
PRO 8:21 Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba. Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha.
PRO 8:22 “Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ.
PRO 8:23 Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; adịkwa m adị tupu e kee ụwa.
PRO 8:24 Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa,
PRO 8:25 tupu e kee ugwu ukwu na ugwu nta.
PRO 8:26 E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya.
PRO 8:27 Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya, mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile;
PRO 8:28 mgbe o hiwere mbara eluigwe, mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike,
PRO 8:29 mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa.
PRO 8:30 Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka. Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ; ana m egwuri egwu nʼihu ya.
PRO 8:31 Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ, ụwa niile na ụmụ mmadụ!
PRO 8:32 “Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị; nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ.
PRO 8:33 Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe, agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ.
PRO 8:34 Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m, onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile, onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m;
PRO 8:35 nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ; ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ.
PRO 8:36 Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ; ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.”
PRO 9:1 Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya nʼelu ogidi asaa.
PRO 9:2 O doziela oriri ya nʼusoro, o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya.
PRO 9:3 O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile, site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị,
PRO 9:4 “Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche” Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị,
PRO 9:5 “Bịanụ, rie nri m, ṅụọkwa mmanya m gwakọtara.
PRO 9:6 Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ; gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.”
PRO 9:7 Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị; onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha.
PRO 9:8 Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị; baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya.
PRO 9:9 Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa, kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya.
PRO 9:10 Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.
PRO 9:11 Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo. A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị.
PRO 9:12 Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru, ma ị bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya.
PRO 9:13 Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ, o nweghị uche; ihere adịghịkwa eme ya.
PRO 9:14 Ọ na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, nʼelu oche nʼebe dịkarịsịrị elu nʼobodo,
PRO 9:15 na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku, bụ ndị na-aga mkpa ha,
PRO 9:16 “Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m.” Ọ na-asịkwa ndị na-enweghị uche,
PRO 9:17 “Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ, nri e riri na nzuzo na-atọkarịkwa nʼụtọ.”
PRO 9:18 Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ, na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ.
PRO 10:1 Ilu dị iche iche nke Solomọn: Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ; ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ.
PRO 10:2 Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru, ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ.
PRO 10:3 Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ, ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma.
PRO 10:4 Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye, ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba.
PRO 10:5 Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe, ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere.
PRO 10:6 Onye ezi omume na-anata ngọzị, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
PRO 10:7 Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị, ma aha onye ajọ omume ga-ere ure.
PRO 10:8 Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu, ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi.
PRO 10:9 Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu, ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta.
PRO 10:10 Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute, onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi.
PRO 10:11 Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
PRO 10:12 Ịkpọ asị na-akpali esemokwu, ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.
PRO 10:13 Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi, ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu.
PRO 10:14 Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma, ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku.
PRO 10:15 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye.
PRO 10:16 Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ, ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ.
PRO 10:17 Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ, ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo.
PRO 10:18 Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asị na onye na-agbasa okwu nkwutọ bụ onye nzuzu.
PRO 10:19 Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị ma ndị nwere uche na-ejide ire ha.
PRO 10:20 Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma, ma obi onye ajọ omume bụ ihe ọnụahịa nta.
PRO 10:21 Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ, ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha.
PRO 10:22 Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya, ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.
PRO 10:23 Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ; ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta.
PRO 10:24 Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya, ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya.
PRO 10:25 Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu; ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi.
PRO 10:26 Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya; ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze.
PRO 10:27 Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ, ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ.
PRO 10:28 Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ; olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu.
PRO 10:29 Ụzọ Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta, maọbụ ịla nʼiyi nye ndị na-eme ajọ ihe.
PRO 10:30 A pụghị iwezuga onye ezi omume, ma onye na-emebi iwu agaghị anọgide.
PRO 10:31 Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa, ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu.
PRO 10:32 Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma, ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie.
PRO 11:1 Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ.
PRO 11:2 Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe.
PRO 11:3 Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha; ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi.
PRO 11:4 Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.
PRO 11:5 Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi, ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha.
PRO 11:6 Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha.
PRO 11:7 Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi, ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi.
PRO 11:8 Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha, ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya.
PRO 11:9 Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya. Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya.
PRO 11:10 Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ, otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ.
PRO 11:11 A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu, ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume.
PRO 11:12 Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu; ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.
PRO 11:13 Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo, ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.
PRO 11:14 Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada, ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.
PRO 11:15 Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ, ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.
PRO 11:16 Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma, ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.
PRO 11:17 Onye nwere obiọma baara onwe ya uru, ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.
PRO 11:18 Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ, ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi.
PRO 11:19 Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ; ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ.
PRO 11:20 Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.
PRO 11:21 Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ, ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta.
PRO 11:22 Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche, dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.
PRO 11:23 Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ, ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ.
PRO 11:24 Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa, ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye.
PRO 11:25 E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya; onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.
PRO 11:26 Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ, ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke.
PRO 11:27 Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma, ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya.
PRO 11:28 Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada, ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.
PRO 11:29 Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe, onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe.
PRO 11:30 Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ, onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe.
PRO 11:31 Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a; a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.
PRO 12:1 Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya, ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ onye na-enweghị ụbụrụ isi.
PRO 12:2 Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị, ma onye na-atụpụta atụmatụ ọjọọ ka ọ na-ama ikpe.
PRO 12:3 Onye ajọ omume agaghị anọgide, ma apụghị ihopu onye ezi omume.
PRO 12:4 Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya, ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.
PRO 12:5 Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi, ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ.
PRO 12:6 Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ, ma okwu ndị omume ha ziri ezi na-anapụta ha.
PRO 12:7 Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi, ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.
PRO 12:8 Onye nwere uche zuruoke ka mmadụ niile na-achọ, ma onye uche ya gbagọrọ agbagọ ka mmadụ na-eleda anya.
PRO 12:9 Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu, karịa ịbụ onye a na-asọpụrụ ma bụrụ onye nri na-adịghị nʼụlọ ya.
PRO 12:10 Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya, ma obi ebere kachasị nro nke onye ajọ omume mere bụ enweghị obi ebere.
PRO 12:11 Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ.
PRO 12:12 Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere, ma mgbọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-eto eto.
PRO 12:13 A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya, ma onye ezi omume na-esi na nsogbu wezuga onwe ya.
PRO 12:14 Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ, inwe mgbalị na-ewetara ya ngọzị.
PRO 12:15 Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi, ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ.
PRO 12:16 Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ, ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya.
PRO 12:17 Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu, ma ajọ onye akaebe na-ekwu okwu ụgha.
PRO 12:18 Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha, ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ.
PRO 12:19 Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi, ma okwu ụgha anaghị adịgide.
PRO 12:20 Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ; ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.
PRO 12:21 Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume, ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu.
PRO 12:22 Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị, ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya.
PRO 12:23 Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha, ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ.
PRO 12:24 Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị, ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye.
PRO 12:25 Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba, ma okwu ọma na-eme ka obi ṅụrịa.
PRO 12:26 Onye ezi omume na-eduzi onye agbataobi ya, ma onye na-emebi iwu na-eduhie ha.
PRO 12:27 Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ, ma ndị na-arụsị ọrụ ike na-eri site nʼakụ ha nwetara nʼịchụ nta.
PRO 12:28 Ụzọ nke onye ezi omume na-eduba na ndụ, nʼụzọ ahụ, ọnwụ adịghị ya.
PRO 13:1 Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba.
PRO 13:2 Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ, ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha.
PRO 13:3 Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka! Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.
PRO 13:4 Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta; ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.
PRO 13:5 Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị, ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu na-ewetara ya ihere na nkọcha.
PRO 13:6 Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile, ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi.
PRO 13:7 Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa. Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya.
PRO 13:8 Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya, ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ.
PRO 13:9 Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ, ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ.
PRO 13:10 Nganga na-eweta esemokwu, ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ.
PRO 13:11 Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa; ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.
PRO 13:12 Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi, mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.
PRO 13:13 Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya, ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya.
PRO 13:14 Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ, nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
PRO 13:15 Ezi nghọta na-eweta ihuọma, ma ụzọ nke ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eduba ha na mbibi.
PRO 13:16 Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ, ma ndị nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya.
PRO 13:17 Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu, ma onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ọgwụgwọ.
PRO 13:18 Onye na-ajụ ịdọ aka na ntị ga-anwụ nʼụkpa na nʼihere; ma onye na-anabata ịdọ aka na ntị ka a ga-asọpụrụ.
PRO 13:19 Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, ma ndị nzuzu kpọrọ isite nʼajọ ihe wezuga onwe ha asị.
PRO 13:20 Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe, nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.
PRO 13:21 Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie, ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume.
PRO 13:22 Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ, ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume.
PRO 13:23 Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri, ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya.
PRO 13:24 Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya; ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.
PRO 13:25 Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya, ma nri na-akọ nʼafọ onye ajọ omume.
PRO 14:1 Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya, ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya.
PRO 14:2 Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị; ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị.
PRO 14:3 Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako, ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha.
PRO 14:4 Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha, ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ.
PRO 14:5 Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ, ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla.
PRO 14:6 Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya; ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ.
PRO 14:7 Si nʼebe onye nzuzu wezuga onwe gị, nʼihi na ị gaghị achọta ihe ọmụma nʼọnụ ya.
PRO 14:8 Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga, ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ.
PRO 14:9 Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo; ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi.
PRO 14:10 Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya, ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya.
PRO 14:11 A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi, ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu.
PRO 14:12 Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.
PRO 14:13 Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị, ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ.
PRO 14:14 Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha, ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya.
PRO 14:15 Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya; ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje.
PRO 14:16 Onye mara ihe na-atụ egwu Onyenwe anyị na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ, ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.
PRO 14:17 Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu, ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị.
PRO 14:18 Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ, ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma.
PRO 14:19 Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ, ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume.
PRO 14:20 Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị, ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi.
PRO 14:21 Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie, ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma.
PRO 14:22 Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu? Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
PRO 14:23 Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru; ma oke okwu na-eweta ụkpa.
PRO 14:24 Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha, ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru.
PRO 14:25 Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ, ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ.
PRO 14:26 Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba; nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ.
PRO 14:27 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ; nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
PRO 14:28 Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị, e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla.
PRO 14:29 Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta, ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya.
PRO 14:30 Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo; ekworo na-eme ka o ree ure.
PRO 14:31 Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya, ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke.
PRO 14:32 Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke, ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara.
PRO 14:33 Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide, ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya.
PRO 14:34 Ezi omume na-ewuli mba elu, ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla.
PRO 14:35 Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe; ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya.
PRO 15:1 Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ; ma okwu ike na-akpali iwe.
PRO 15:2 Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa, ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche.
PRO 15:3 Onyenwe anyị na-ahụzu ihe niile, anya ya dịkwa nʼahụ ndị ọma na ndị ọjọọ.
PRO 15:4 Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume; ma nkwutọ na-eweta ịda mba.
PRO 15:5 Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu; ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche.
PRO 15:6 Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ, ma akụ ndị na-emebi iwu na-ewetara ha nsogbu.
PRO 15:7 Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma, ma obi ndị nzuzu ezighị ezi.
PRO 15:8 Onyenwe anyị na-akpọ aja ndị ajọ omume asị, ma ekpere ndị ndụ ha ziri ezi na-atọ ya ụtọ.
PRO 15:9 Onyenwe anyị kpọrọ ụzọ ndị na-emebi iwu asị, ma ndị na-achụso ezi omume ka ọ na-ahụ nʼanya.
PRO 15:10 Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ. Onye kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ ọnwụ.
PRO 15:11 Onyenwe anyị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ; ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ?
PRO 15:12 Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ma a baara ya mba, ya mere ọ dịghị ejekwuru onye maara ihe.
PRO 15:13 Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma. Ihu gbarụrụ agbarụ na-egosi obi nwere ihe mwute.
PRO 15:14 Obi nwere nghọta na-achọ ịmata ihe, ma ọnụ onye nzuzu na-azụ onwe ya nʼokwu na-abaghị uru.
PRO 15:15 Ndụ onye ogbenye jupụtara nnọọ na mgbalị, ma ndị nwere udo nʼobi na-eri oriri mgbe niile.
PRO 15:16 Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị, karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu.
PRO 15:17 Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya, karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya.
PRO 15:18 Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ; ma onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ na-eme ka ịlụ ọgụ kwụsị.
PRO 15:19 Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ, ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị.
PRO 15:20 Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ, ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.
PRO 15:21 Onye na-enweghị uche na-aṅụrị ọṅụ nʼime amaghị ihe ya, ma onye nwere nghọta na-aga ije nʼụzọ ziri ezi.
PRO 15:22 Nzube na-enweghị ndụmọdụ na-ama afọ nʼala, ma ndị ndụmọdụ dịrị ọtụtụ ọganihu ga-adị.
PRO 15:23 Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma, okwu e kwuru nʼoge o kwesiri dị mma.
PRO 15:24 Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche, iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru.
PRO 15:25 Onyenwe anyị na-adọtu ma na-adọrisi ụlọ nke onye mpako, ma oke ala nke nwanyị di ya nwụrụ ka ọ na-elekọta.
PRO 15:26 Echiche ọjọọ niile nke ndị na-emebi iwu ka Onyenwe anyị kpọrọ asị ma okwu ebere niile dị ọcha nʼanya ya.
PRO 15:27 Onye anya ukwu na-ewetara ezinaụlọ ya nsogbu. Ma onye kpọrọ iri ngarị asị ga-adị ndụ.
PRO 15:28 Obi onye ezi omume na-atule ọsịsa ya ma ọnụ nke onye ajọ omume na-asọpụta ihe ọjọọ dị iche iche.
PRO 15:29 Onyenwe anyị anọghị ndị na-emebi iwu nso; ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume.
PRO 15:30 Ihu ọchị na-eweta obi ụtọ. Akụkọ ọma na-enyekwa ọkpụkpụ ndụ.
PRO 15:31 Onye na-ege ntị nye ịba mba nke na-enye ndụ ga-esoro ndị amamihe nọrọ.
PRO 15:32 Onye jụrụ ịdọ aka na ntị kpọrọ onwe ya asị ma onye ọbụla naara ndụmọdụ nwere nghọta.
PRO 15:33 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị; onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.
PRO 16:1 Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime, ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.
PRO 16:2 Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya, ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.
PRO 16:3 Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.
PRO 16:4 Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya, o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.
PRO 16:5 Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị. Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.
PRO 16:6 Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie; ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.
PRO 16:7 Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.
PRO 16:8 Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi.
PRO 16:9 Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị, maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.
PRO 16:10 Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta, ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.
PRO 16:11 Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị Onyenwe anyị, ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha.
PRO 16:12 Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị, nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike.
PRO 16:13 Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu, ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ.
PRO 16:14 Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ. Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ.
PRO 16:15 Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ, ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.
PRO 16:16 Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.
PRO 16:17 Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ, ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha.
PRO 16:18 Nganga na-eweta ịla nʼiyi, mpako na-ewetakwa ọdịda.
PRO 16:19 Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga, na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.
PRO 16:20 Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma, onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.
PRO 16:21 A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere. Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma.
PRO 16:22 Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya, ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ.
PRO 16:23 Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya, egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu.
PRO 16:24 Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ, ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.
PRO 16:25 Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.
PRO 16:26 Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ; agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu.
PRO 16:27 Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ, egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ.
PRO 16:28 Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu; ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi.
PRO 16:29 Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha, na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi.
PRO 16:30 Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ, onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie.
PRO 16:31 Isi awọ bụ okpueze nke mara mma, a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.
PRO 16:32 Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya. Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.
PRO 16:33 A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị, maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.
PRO 17:1 Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya, karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ.
PRO 17:2 Ohu nwere uche ga-achị nwa nna ya ukwu na-eweta ihere ma ketakwa oke nʼihe nketa dịka otu nʼime ndị ezinaụlọ ahụ.
PRO 17:3 Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma Onyenwe anyị na-anwale obi.
PRO 17:4 Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie, onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi.
PRO 17:5 Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo ọ bụ Chineke kere ha ka ọ na-elelị anya. Ndị niile na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe ike dakwasịrị ha aghaghị ịta ahụhụ.
PRO 17:6 Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye. Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.
PRO 17:7 Egbugbere ọnụ na-ekwu okwu dị mma abụghị nke onye nzuzu, otu a kwa, egbugbere ọnụ na-agha ụgha ekwesighị ịbụ nke onye na-achị achị.
PRO 17:8 Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ, ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma.
PRO 17:9 Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie, ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi.
PRO 17:10 Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu.
PRO 17:11 Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi megide Chineke. Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ ka a ga-eziga imegide ya.
PRO 17:12 Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ.
PRO 17:13 Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma, ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị.
PRO 17:14 Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya, nʼihi ya ekwela ka ọ malite.
PRO 17:15 Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe, Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị.
PRO 17:16 Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu; ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe.
PRO 17:17 Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla. Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.
PRO 17:18 Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji, si otu a ghọọ onye ji ụgwọ.
PRO 17:19 Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya. Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku.
PRO 17:20 Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ. Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu.
PRO 17:21 Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu.
PRO 17:22 Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike, ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.
PRO 17:23 Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị na nzuzo ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi.
PRO 17:24 Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme, ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa.
PRO 17:25 Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute, bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu.
PRO 17:26 Ọ bụrụ na ịra onye ezi omume nra adịghị mma, nʼezie, ịpịa ndị ọrụ ihe nʼihi ezi ọrụ ha ezighị ezi.
PRO 17:27 Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe, onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta.
PRO 17:28 A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma ọ bụrụ na ha gba nkịtị, gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma ọ bụrụ na ha e jide ire ha.
PRO 18:1 Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya, na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.
PRO 18:2 Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ. Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.
PRO 18:3 Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata, otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.
PRO 18:4 Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi, ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.
PRO 18:5 Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ, si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.
PRO 18:6 Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu, ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.
PRO 18:7 Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu, egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.
PRO 18:8 Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
PRO 18:9 Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi.
PRO 18:10 Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike, ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
PRO 18:11 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.
PRO 18:12 Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga, ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.
PRO 18:13 Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị bụ enweghị uche na ihe ihere.
PRO 18:14 Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa, ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?
PRO 18:15 Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma, nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya.
PRO 18:16 Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara, ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.
PRO 18:17 Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara, tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ.
PRO 18:18 Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu.
PRO 18:19 Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa. Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.
PRO 18:20 Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya. Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ.
PRO 18:21 Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka. Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.
PRO 18:22 Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe. Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.
PRO 18:23 Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere; ma ọgaranya na-asa okwu ike ike.
PRO 18:24 Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya, ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.
PRO 19:1 Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile.
PRO 19:2 Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma otu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ.
PRO 19:3 Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm, ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị.
PRO 19:4 Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi, ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.
PRO 19:5 Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ, ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.
PRO 19:6 Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ, otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye.
PRO 19:7 Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị, gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme? Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ ezughị ime ka ha nọgide.
PRO 19:8 Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya, onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.
PRO 19:9 Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ, onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi.
PRO 19:10 Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya; ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze.
PRO 19:11 Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi; ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.
PRO 19:12 Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm. Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ.
PRO 19:13 Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna, nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm, mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu.
PRO 19:14 Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna, ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.
PRO 19:15 Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra, onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ.
PRO 19:16 Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ, ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ.
PRO 19:17 Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe, ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.
PRO 19:18 Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị. Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi.
PRO 19:19 Onye oke iwe ga-anata nra so ya, nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ.
PRO 19:20 Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị. Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe.
PRO 19:21 Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ; maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.
PRO 19:22 Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike. Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya.
PRO 19:23 Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ, na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ.
PRO 19:24 Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri, ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya.
PRO 19:25 Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche, baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma.
PRO 19:26 Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi, maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.
PRO 19:27 Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m, ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo.
PRO 19:28 Onyeama ụgha na-akwa ikpe ziri ezi emo. Ọnụ nke onye ajọ omume na-eloda ajọ ihe.
PRO 19:29 Ndị na-akwa emo na ndị nzuzu ga-ata ahụhụ; a ga-etikwa ha ihe.
PRO 20:1 Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ. Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.
PRO 20:2 Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm; ndị na-akpasu ya iwe ga-atụfu ndụ ha.
PRO 20:3 Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka, ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu.
PRO 20:4 Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya. Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.
PRO 20:5 Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi, ma onye nwere nghọta na-adọpụta ha.
PRO 20:6 Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ, ma onye kwesiri ntụkwasị obi, onye pụrụ ịchọta ya?
PRO 20:7 Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke, ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ.
PRO 20:8 Mgbe eze na-anọkwasị nʼocheeze ya ikpe ikpe, ọ na-eji anya ya abụọ afụchapụ ihe ọjọọ niile.
PRO 20:9 Onye pụrụ ị sị, “Emeela m ka obi m dị ọcha; Abụ m onye dị ọcha, mmehie adịghịkwa nʼime m?”
PRO 20:10 Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu, ha niile bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị.
PRO 20:11 Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile, nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi?
PRO 20:12 Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ, ọ bụ Onyenwe anyị mere ha abụọ.
PRO 20:13 Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa. Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.
PRO 20:14 “Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị, ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara.
PRO 20:15 Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba, ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa.
PRO 20:16 Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe. Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe.
PRO 20:17 Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ. Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ.
PRO 20:18 Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime; ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa.
PRO 20:19 Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị, nʼihi na ọ ga-akụ ya nʼekwe nye ụwa niile.
PRO 20:20 Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya ka Chineke na-afụnyụ.
PRO 20:21 Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ, agaghị agọzi ya nʼikpeazụ.
PRO 20:22 A sịkwala, “Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a.” Chere Onyenwe anyị, ọ ga-abọrọ gị ọbọ.
PRO 20:23 Onyenwe anyị kpọrọ ihe ọtụtụ gbara iche iche asị, ihe ọtụtụ aghụghọ adịghị atọ ya ụtọ.
PRO 20:24 Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ. Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha?
PRO 20:25 Ime ngwangwa doo ihe nsọ, bụ ịma nʼọnya ma mesie tụgharịwa uche banyere imezu nkwa ahụ.
PRO 20:26 Eze maara ihe na-afụchapụ ndị ajọ omume, ọ na-eji wịịlu ịfụcha mkpụrụ gaa nʼelu ha.
PRO 20:27 Akọnuche mmadụ bụ ọkụ Onyenwe anyị ji enyocha mmụọ ya, ọ na-egwupụta ala ala obi ya, igosi anyị ihe anyị bụ.
PRO 20:28 Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze, site nʼịhụnanya ka ocheeze ya na-eguzo chịm.
PRO 20:29 Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha, ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye.
PRO 20:30 Ọkpọ na mmerụ ahụ na-ehichapụ ihe ọjọọ, ụtarị na-asachapụ ime ime nke ahụ mmadụ.
PRO 21:1 Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị, nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma.
PRO 21:2 Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya, ma Onyenwe anyị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile.
PRO 21:3 Ime ezi omume na ihe ziri ezi ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja.
PRO 21:4 Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ nke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie.
PRO 21:5 Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru, dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ.
PRO 21:6 Uru niile enwetara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị adịgide, ha bụ nkuume ifufe na-efesa, ndị na-achọ ya na-achọ ọnwụ.
PRO 21:7 Nʼihi na ndị na-emebi iwu anaghị eme ihe ọma, ihe ọjọọ ha na-eme na-alaghachi laa ha nʼiyi.
PRO 21:8 Ụzọ onye na-emebi iwu bụ ihe gbagọrọ agbagọ, ma omume onye aka ya dị ọcha ziri ezi.
PRO 21:9 Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.
PRO 21:10 Ihe na-atọ onye ọjọọ ụtọ bụ imerụ ndị ọzọ ahụ; ọ maghị imere mmadụ ibe ya ebere.
PRO 21:11 Mgbe a na-ata onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-enweghị uche na-enweta amamihe, ma mgbe a na-akụziri onye maara ihe ihe ọ na-enweta ihe ọmụma.
PRO 21:12 Onye ezi omume na-amụta ihe site nʼile ụlọ onye ajọ omume anya na-emekwa ka ndị ajọ omume laa nʼiyi.
PRO 21:13 Onye na-adịghị ege ntị na mkpu onye ogbenye, ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu ma agaghị aza ya.
PRO 21:14 Onyinye enyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ, otu a kwa, ngarị ezonyere nʼime uwe na-eme ka oke ọnụma dajụọ.
PRO 21:15 Onye ezi omume na-aṅụrị ọṅụ mgbe e kpere ikpe ziri ezi, ma bụrụ ihe oke egwu dịrị ndị na-eme ajọ ihe.
PRO 21:16 Onye ọbụla si nʼụzọ nghọta wezuga onwe ya ga-eso nʼotu ndị nwụrụ anwụ.
PRO 21:17 Nwoke hụrụ ibi ndụ nganga nʼanya na-ada ụkpa; ịṅụ mmanya na oke oriri abụghị ụzọ esi akpata akụ.
PRO 21:18 Onye ajọ omume ga-abụ ihe mgbapụta maka onye ezi omume, onye aghụghọ ga-abụkwa ihe mgbapụta maka onye ndụ ya ziri ezi.
PRO 21:19 Ọ ka mma ibi nʼọzara karịa ibinyere nwanyị na-atamu ntamu na-esekwa okwu.
PRO 21:20 Onye maara ihe na-edebe ezi ihe oriri na mmanụ oliv nʼụlọ ya, ma onye nzuzu na-eloda ihe niile nʼọnụ ya.
PRO 21:21 Onye na-achụso ezi omume na ịhụnanya ga-achọta ndụ, na ugwu na ọganihu.
PRO 21:22 Onye maara ihe nwere ike megide obodo ndị dike, kwatuokwa ebe ewusiri ike nke ha tụkwasịrị obi ha.
PRO 21:23 Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya na-egbochiri onwe ya ọdachi.
PRO 21:24 Onye nganga na onye mpako, onye na-akwa emo bụ aha ya. Ọ na-eji oke nganga eme ihe niile.
PRO 21:25 Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ.
PRO 21:26 Kwa ụbọchị ka ọ na-achọ inwe karịa, ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke.
PRO 21:27 Chineke kpọrọ aja ndị na-emebi iwu asị, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha na-enye onyinye a site na nzube ọjọọ.
PRO 21:28 Onyeama ụgha ga-ala nʼiyi, ma onye ọbụla na-ege ya ntị ka a ga-ebibi ruo ebighị ebi.
PRO 21:29 Ndị ajọ omume na-ebi ndụ atụghị egwu, ma ndị omume ha ziri ezi na-atụgharị uche nʼụzọ ha niile.
PRO 21:30 O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla, nke pụrụ iguzosi ike megide Onyenwe anyị.
PRO 21:31 E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha, maọbụ naanị Onyenwe anyị na-enye mmeri.
PRO 22:1 Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ, ịnata amara ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.
PRO 22:2 Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu Onyenwe anyị onye kere ha niile.
PRO 22:3 Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya, ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.
PRO 22:4 Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị, ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.
PRO 22:5 Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu; ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ.
PRO 22:6 Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi, mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
PRO 22:7 Dịka ọgaranya si achị ogbenye, otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.
PRO 22:8 Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi, mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa.
PRO 22:9 Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.
PRO 22:10 Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị, e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa.
PRO 22:11 Onye na-ahụ ịdị ọcha nke obi nʼanya, onye okwu ya jupụtara nʼamara ga-abụ enyi eze.
PRO 22:12 Anya Onyenwe anyị na-echebe ihe ọmụma, ma ọ na-emebi atụmatụ niile nke ndị aghụghọ.
PRO 22:13 Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼezi! A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!”
PRO 22:14 Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu, nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya.
PRO 22:15 Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche, ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya.
PRO 22:16 Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike, maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ.
PRO 22:17 Lezie anya gee ntị nʼokwu niile nke ndị maara ihe, tinye uche gị nʼihe m na-akụzi.
PRO 22:18 Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị, ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile.
PRO 22:19 Ọ bụ ka ntụkwasị obi gị dị nʼime Onyenwe anyị, ya ka m na-akụziri gị taa, ọbụladị gị onwe gị.
PRO 22:20 Ọ bụ na m edepụtabereghị gị iri ndụmọdụ atọ ndị a, bụ okwu ndụmọdụ na ihe ọmụma?
PRO 22:21 Ha na-ezi gị ihe bụ ikwesi ntụkwasị obi na ikwu eziokwu. Mgbe ahụ ọ bụrụ na-ezie gị sị gị gaa chọta eziokwu ị ga-eji ezi ọsịsa lọghachi.
PRO 22:22 Emegbula ogbenye nʼihi na ọ bụ ogbenye. Emegidekwala ya nʼụzọ ikpe.
PRO 22:23 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekwuchitere ha ọnụ ha ma bibiekwa ndị na-emegide ha.
PRO 22:24 Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi, gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe,
PRO 22:25 ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha, si otu a tinye ndụ gị na nsogbu.
PRO 22:26 Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji.
PRO 22:27 Nʼihi na ọ bụrụ na i nweghị ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ, a ga-anapụ gị ọ bụladị ihe ndina gị.
PRO 22:28 Ehigharịla oke ala e tinyere site na mgbe ochie. Nke ndị nna ochie gị ha hiwere.
PRO 22:29 Ị hụrụ mmadụ ahụ nke nwere ǹka nʼịrụ ọrụ ya nke ọma? Ọ ga-eguzo nʼihu ndị eze, ọ gaghị eguzo nʼihu ndị a na-amaghị aha ha.
PRO 23:1 Mgbe gị na onye na-achị achị nọdụrụ irikọ nri, lezie ihe dị nʼihu gị anya,
PRO 23:2 tụkwasị mma nʼakpịrị gị, ma ọ bụrụ na ị bụ onye iri oke nri na-atọ ụtọ.
PRO 23:3 Achọsila nri ụtọ ya ike, nʼihi na nri ahụ bụ nri aghụghọ.
PRO 23:4 Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị.
PRO 23:5 Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.
PRO 23:6 Erila nri onye aka ntagide na-enye gị. Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ.
PRO 23:7 Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị. Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ.
PRO 23:8 Ị ga-agbọkwa nke ntakịrị ahụ i riri mgbe ahụ, okwu ọma ahụ niile i kwuru banyere ya ga-abụ ihe efu.
PRO 23:9 Atụfula ume gị ịgwa onye nzuzu okwu, nʼihi na ọ ga-eleda okwu i sitere nʼezi uche kwuo anya.
PRO 23:10 Anarala nwa na-enweghị nne na nna ala ya site nʼihigharị oke ala e gwunyere site nʼoge gara aga,
PRO 23:11 nʼihi na onye mgbapụta ha dị ike; ya onwe ya ga-ekwuchitere ha ọnụ ha.
PRO 23:12 Tinye uche gị nʼịdọ aka na ntị; gekwaa ntị nụrụ okwu ihe ọmụma niile.
PRO 23:13 Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị. Ha agaghị anwụ nʼihi na ị tiri ha ihe.
PRO 23:14 Jiri mkpara tie ya ihe ma zọpụta ndụ ya site nʼọnwụ.
PRO 23:15 Nwa m, aga m aṅụrị ọṅụ nke ukwuu ma ọ bụrụ na ị ghọọ onye maara ihe.
PRO 23:16 Mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ mgbe egbugbere ọnụ gị abụọ kwuru ihe ziri ezi.
PRO 23:17 Ekwela ka obi gị kwosa ndị mmehie ekworo, kama nọgide nʼịnụ ọkụ nʼobi nʼịtụ egwu Onyenwe anyị mgbe niile,
PRO 23:18 nʼihi na i nwere ọtụtụ ihe ọma nʼihu gị. Olileanya dị ukwuu dịrị gị.
PRO 23:19 Nwa m, nwee uche, gbasookwa ụzọ Chineke.
PRO 23:20 Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke, na ndị iri oke oriri na-atọ ụtọ,
PRO 23:21 nʼihi na ihe niile ga-akọ ha. Ọ bụkwa nkịrịnka akwa ka onye oke ụra na-eyi nʼahụ.
PRO 23:22 Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị, akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị.
PRO 23:23 Zụta eziokwu, erekwala ya, zụtakwa amamihe, ntụziaka, na nghọta.
PRO 23:24 Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe.
PRO 23:25 Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa.
PRO 23:26 Nwa m, nye m obi gị ka ụzọ m niile nyekwa anya gị ọṅụ.
PRO 23:27 Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara.
PRO 23:28 Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke.
PRO 23:29 Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ? Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa? Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara?
PRO 23:30 Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya, onye na-aga ịchọpụta mmanya agwara agwa.
PRO 23:31 Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko.
PRO 23:32 Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ na-atụkwa dịka ajụala.
PRO 23:33 Anya gị abụọ ga-ahụ ihe ị na-amaghị isi ya na ọdụ ya, obi gị ga-atụlekwa ihe ndị na-agbagwoju anya.
PRO 23:34 Ị ga-adị ka onye na-edina nʼetiti oke osimiri, nke na-edinakwa nʼelu ụdọ nʼejide ụgbọ.
PRO 23:35 Ị ga-asị, “Ha tiri m ihe, ma emerụghị m ahụ. Ha pịara m ihe, ma amaghị m. Olee mgbe m ga-eteta, ka m pụọ ga chọọ mmanya ọzọ?”
PRO 24:1 Ekwosola ndị ajọ omume ekworo, ka ihe banyere ha ghara ịtọ gị ụtọ.
PRO 24:2 Nʼihi na-atụmatụ obi ha niile bụ otu ha ga-esi mee ihe ike, egbugbere ọnụ ha na-ekwu naanị maka ọgbaaghara.
PRO 24:3 Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọ, ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike.
PRO 24:4 Sitekwa nʼihe ọmụma ka akụ niile ji ejupụta nʼime ya, bụ akụ ndị pụrụ iche ma dịkwa oke ọnụahịa.
PRO 24:5 Onye maara ihe na-emeri site nʼịdị ike, ndị nwere ọmụma ihe na-akpali ike ha.
PRO 24:6 Ejela ọgụ ma ọ bụghị na i nwetara ezi ndụmọdụ, nʼihi na nzọpụta dị nʼige ọtụtụ ndị ndụmọdụ ntị.
PRO 24:7 Amamihe dị elu nke ukwuu nye ndị nzuzu, ha gaghị asaghe ọnụ ha nʼọgbakọ ọnụ ụzọ ama.
PRO 24:8 Onye na-eche echiche ime ihe ọjọọ ka a ga-agụ dịka onye nzube ihe ọjọọ
PRO 24:9 Nzube niile nke onye na-enweghị uche bụ mmehie, ndị mmadụ na-akpọ onye na-akwa emo asị.
PRO 24:10 Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu, ị bụ nnọọ onye ike ya dị ntakịrị.
PRO 24:11 Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ. Napụtakwa ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ nʼụzọ na-ezighị ezi.
PRO 24:12 Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,” ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya? Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya? Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị?
PRO 24:13 Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma. Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ.
PRO 24:14 Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ. Ọ bụrụ na i chọta ya i nwere olileanya nke ga-adịgide.
PRO 24:15 Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume. A gakwala ga kwakọrọ ihe dị nʼụlọ ya.
PRO 24:16 Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ. Ma ndị na-emebi iwu na-asọ ngọngọ mgbe nsogbu bịakwasịrị ha.
PRO 24:17 Aṅụrịla ọṅụ mgbe onye iro gị dabara na nsogbu. Ka obi gharakwa ịtọ gị ụtọ mgbe ọ dara.
PRO 24:18 Nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ iwe iwe nʼihi ya megide gị ma kwụsị ịta ya ahụhụ.
PRO 24:19 Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo, maọbụ nwe anya ukwu nʼebe onye ajọ omume nọọ.
PRO 24:20 Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu; a ga-afụnyụkwa ọkụ onye ajọ omume.
PRO 24:21 Nwa m, tụọ egwu Onyenwe anyị na onye bụ eze, esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu.
PRO 24:22 Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya. Onye maara ihe ga-abụ ọgwụgwụ ya?
PRO 24:23 Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru, iji gosi na ikpe ikpe na-akwụghị ọtọ adịghị mma.
PRO 24:24 Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, “Onye ezi omume ka ị bụ,” ga-anata ọbụbụ ọnụ site nʼọnụ ọtụtụ mmadụ, mba niile ga-eweso ya iwe.
PRO 24:25 Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma, ha ga-anatakwa ezi ngọzị.
PRO 24:26 Ọsịsa ziri ezi bụ ihe na-egosi ikwesi ntụkwasị obi.
PRO 24:27 Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi. Dozie ala ubi gị. Emesịa wuoro onwe gị ụlọ.
PRO 24:28 Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị nʼefu. Ọ bụ egbugbere ọnụ gị abụọ ka ị ga-eji ghọọ aghụghọ?
PRO 24:29 Asịla, “Aga m emeso ha dịka ha siri meso m. Aga m akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere.”
PRO 24:30 Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee, bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche,
PRO 24:31 hụ na ogwu etochiela ya, ahịhịa etochiekwala ya; mgbidi dị ya gburugburu adaakwala.
PRO 24:32 Elegharịrị m ya anya site na ya mụta otu ihe a:
PRO 24:33 Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike
PRO 24:34 ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.
PRO 25:1 Ndị a bụkwa ilu Solomọn, nke ndị ozi Hezekaya eze ndị Juda dekọtara nʼakwụkwọ.
PRO 25:2 Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu, ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu.
PRO 25:3 Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala, otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta.
PRO 25:4 Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha, onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere;
PRO 25:5 wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze, ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume.
PRO 25:6 Egosipụtala onwe gị nʼihu eze, ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ,
PRO 25:7 ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ si gị, “Rigota nʼebe a,” karịa na o wedara gị ala nʼihu ndị oke mmadụ. Ihe iji anya gị abụọ hụ
PRO 25:8 e mekwala ngwangwa ịga nʼụlọikpe, nʼihi na ọ bụ gịnị ka ị ga-eme nʼikpeazụ ma ọ bụrụ nʼonye agbataobi gị etinye gị nʼọnọdụ ihere?
PRO 25:9 Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ enwee esemokwu, dozienụ ya nʼonwe unu, emekwala ka ndị ọzọ mata okwu nzuzo gị na onye ọzọ kwuru,
PRO 25:10 ma ọ bụghị ya, onye nụrụ ya nwere ike menye gị ihere, agwa ọjọọ gị agaghị enwekwa ọgwụgwụ.
PRO 25:11 Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha.
PRO 25:12 Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya.
PRO 25:13 Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ, dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi.
PRO 25:14 Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri.
PRO 25:15 Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri, nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ.
PRO 25:16 Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ? Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa.
PRO 25:17 Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ị ghara ire ugwu gị.
PRO 25:18 Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha, dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.
PRO 25:19 Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe, maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ.
PRO 25:20 Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ, maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya, otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị.
PRO 25:21 Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.
PRO 25:22 Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya, Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị.
PRO 25:23 Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo, otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.
PRO 25:24 Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.
PRO 25:25 Oziọma e sitere na mba dị anya nata dị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ.
PRO 25:26 Onye ezi omume nke kwenyere nʼihe onye na-emebi iwu kwuru dị ka iyi a gwọrụrụ nʼisi ya.
PRO 25:27 Dịka ịracha mmanụ aṅụ hie nne si jọọ njọ, otu a ka o si bụrụ ihe na-enweghị nsọpụrụ, mmadụ ịchọpụta ihe ndị ezomiri ezomi.
PRO 25:28 Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ ya dị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ.
PRO 26:1 Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ dịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi.
PRO 26:2 Dịka nnụnụ nta na-efegharị efegharị, maọbụ dịka eleke na-awụgharị otu a ka ọbụbụ ọnụ na-ekwesighị agaghị ere.
PRO 26:3 Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ; otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu.
PRO 26:4 A zaghachila onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị, ma ọ bụghị ya gị onwe gị ga-adị ka ya.
PRO 26:5 Zaa onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị, ma ọ bụghị ya ọ ga-abụ onye maara ihe nʼanya onwe ya.
PRO 26:6 Iziga ozi site nʼaka onye nzuzu dịka mmadụ ibipụ ụkwụ ya maọbụ ịṅụ ihe ike dịka mmiri.
PRO 26:7 Dịka onye ngwụrọ si eji ụkwụ ya eje ije, otu a ka ilu si esite nʼọnụ onye nzuzu apụta.
PRO 26:8 Ọ baghị uru inye onye nzuzu nsọpụrụ, nʼihi na ọ gaghị anọgide. Ọ dị ka ịwụ ọkụkọ mmiri nʼazụ.
PRO 26:9 Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke otu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu.
PRO 26:10 Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi, otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya.
PRO 26:11 Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ, otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha.
PRO 26:12 Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya? Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a.
PRO 26:13 Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ, ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!”
PRO 26:14 Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya, otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya.
PRO 26:15 Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri ma oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya.
PRO 26:16 Nʼuche ya, onye umengwụ na-eche na ọ maara ihe karịa ndị ikom asaa na-eji ezi uche azaghachi okwu.
PRO 26:17 Onye na-etinye onwe ya nʼesemokwu na-agbasaghị ya dị ka mmadụ na-apụ nʼokporoụzọ dọkpụrụ nkịta ọbụla ọ hụrụ na ntị.
PRO 26:18 Dịka onye ara na-agba àkụ na-ere ọkụ nke na-eweta ọnwụ,
PRO 26:19 ka nwoke ahụ bụ nke na-aghọgbu onye agbataobi ya ma sị, “ọ bụ naanị egwuregwu ka m na-egwu.”
PRO 26:20 Ọkụ na-anyụ mgbe nkụ gwụrụ, otu a kwa esemokwu na-akwụsị mgbe a kwụsịrị ikwu ndị ọzọ okwu nʼazụ.
PRO 26:21 Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ, otu a ka onye na-ese okwu si eme ka ọgụ nwuru ọkụ.
PRO 26:22 Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
PRO 26:23 Dịka ite aja ụrọ nke e ji ọlaọcha na-abaghị uru techie, ka egbugbere ọnụ dị nro nke obi jupụtara nʼihe ọjọọ bụ.
PRO 26:24 Ndị iro na-eji egbugbere ọnụ ha gbanwee onwe ha, ma nʼime obi ha ọ bụ naanị aghụghọ dị ya.
PRO 26:25 Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha, nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼime obi ha.
PRO 26:26 Ọ bụ ezie na ọ ga na-eme ka ọ hụrụ gị nʼanya, ma iro ya ga-apụta ihe, mmadụ niile ga-ahụkwa ya.
PRO 26:27 Onye na-egwuru ibe ya olulu ga-adaba nʼime ya. Ọzọ, onye na-enuda nkume, ya ka nkume ahụ ga-adagbu.
PRO 26:28 Onye ị kpọrọ asị bụ onye ị ga-achọ iwetara ihe mgbu site nʼịgha ụgha. Okwu ọma na-esighị nʼobi mmadụ pụta na-eweta ịla nʼiyi.
PRO 27:1 Anyala isi banyere echi, nʼihi na ị maghị ihe echi ga-abụ.
PRO 27:2 Ka onye ọzọ too gị, ọ bụghị ọnụ gị. Ka onye ọzọ too gị, ka egbugbere ọnụ gị abụọ ghara ito gị.
PRO 27:3 Nkume dị arọ, aja bụkwa ibu arọ, ma mkpasu iwe nke onye nzuzu dị arọ karịa ha abụọ.
PRO 27:4 Iwe na-emebi ihe, ma ekworo jọrọ njọ karịa iwe.
PRO 27:5 Mba abara nʼihe ka mma karịa ịhụnanya ezoro ezo.
PRO 27:6 Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ, ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa.
PRO 27:7 Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ; ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu.
PRO 27:8 Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya.
PRO 27:9 Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa, otu a ka ụtọ enyi dị, site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha.
PRO 27:10 Ahapụla enyi gị maọbụ ndị enyi nna gị. Mgbe ị nọ na mkpa arịọla nwanne gị ka o nyere gị aka. Onye agbataobi nọ gị nso nwere ike inyere gị aka karịa nwanne gị nọ ebe dị anya.
PRO 27:11 Nwa m, obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu ma a sị na ị ga-amụta ihe! Mgbe ahụ, aga m enwe ihe m ga-asa ndị na-akọcha m.
PRO 27:12 Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya. Ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.
PRO 27:13 Chịrị uwe onye ahụ nke naara onye mba ọzọ na mbe. E, chiri ya ma ọ bụrụ nwanyị na-abụghị nwunye ya ka o nara na mbe.
PRO 27:14 Ọ bụrụ na onye ọbụla e jiri oke olu gọzie onye agbataobi ya nʼisi ụtụtụ a ga-agụ nke a dịka ịbụ ọnụ.
PRO 27:15 Mmiri na-ata nʼime ụlọ mgbe mmiri na-ezo na nwanyị na-eso okwu bụ otu.
PRO 27:16 Onye nwere ike ịkwụsị ya nwere ike iji aka jide ifufe, maọbụ were aka jide mmanụ.
PRO 27:17 Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ, otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ.
PRO 27:18 Onye na-eche osisi fiig nche ga-eri mkpụrụ ya, onye na-echebekwa nna ya ukwu ka a ga-asọpụrụ.
PRO 27:19 Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ.
PRO 27:20 Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi, otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ.
PRO 27:21 Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma a na-anwale ndị mmadụ site nʼotuto a na-enye ha.
PRO 27:22 Nʼagbanyeghị na ị ga-egwepịa onye nzuzu nʼime ikwe, were aka odo gwee ha dịka mkpụrụ ọka, ị pụghị isite nʼahụ ha wepụ enweghị uche ha.
PRO 27:23 Lezie ọrụ gị anya nke ọma, marakwa ọnọdụ igwe ewu na atụrụ gị na anụ ụlọ ndị ọzọ,
PRO 27:24 nʼihi na akụnụba adịghị adịgide. Ọ bụladị okpueze nke onye eze na-emesịa gabiga.
PRO 27:25 Mgbe e gbupụchara ahịhịa ochie, nke ọhụrụ na-epupụta, mgbe ahụ ka a na-achịkọbata ahịhịa sị nʼugwu.
PRO 27:26 Ụmụ atụrụ ga-enye gị uwe ị ga-eyi, ụmụ ewu ga-enyekwa gị ego ọnụahịa ala ubi gị.
PRO 27:27 Ị ga-enwe mmiri ara ewu nke ga-ezuru gị na ndị ezinaụlọ gị nri, na nke ga-edozi ahụ ndị odibo nwanyị gị.
PRO 28:1 Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha, ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm.
PRO 28:2 Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi, ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge.
PRO 28:3 Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye, bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị.
PRO 28:4 Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume, ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.
PRO 28:5 Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara, ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.
PRO 28:6 Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ.
PRO 28:7 Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru, ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.
PRO 28:8 Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye, na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere.
PRO 28:9 Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị, ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ.
PRO 28:10 Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ, ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara, ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa.
PRO 28:11 Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe, ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya.
PRO 28:12 Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ, ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu.
PRO 28:13 Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya. Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.
PRO 28:14 Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke, ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu.
PRO 28:15 Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụ otu a ka onye ọchịchị ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị ike dị.
PRO 28:16 Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya; ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị.
PRO 28:17 Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe ruo ala mmụọ. Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka.
PRO 28:18 Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe, ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu.
PRO 28:19 Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ.
PRO 28:20 Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị, ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.
PRO 28:21 Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya. Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri.
PRO 28:22 Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.
PRO 28:23 Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.
PRO 28:24 Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa, “Olee ihe ọjọọ dị na ya?” Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi.
PRO 28:25 Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu, ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.
PRO 28:26 Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu! Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.
PRO 28:27 Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị. Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.
PRO 28:28 Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha, ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba.
PRO 29:1 Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ, nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ.
PRO 29:2 Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ, ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị.
PRO 29:3 Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa, ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi.
PRO 29:4 Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu, ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi.
PRO 29:5 Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma bụ ọnya ka ọ na-esiri ya.
PRO 29:6 Ọ bụ onye ajọ omume siri ọnya ka ọnya ahụ na-ama. Ma ndị ezi omume na-anọrọ onwe ha na-agụ egwu ọṅụ.
PRO 29:7 Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye, ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi.
PRO 29:8 Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile, ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị.
PRO 29:9 Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe, onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị.
PRO 29:10 Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị, ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi.
PRO 29:11 Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya, ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
PRO 29:12 Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha, ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume.
PRO 29:13 Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a: ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ.
PRO 29:14 Ọ bụrụ na eze esite nʼizi ezi kpee ndị ogbenye ikpe, a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
PRO 29:15 Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa, ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.
PRO 29:16 Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị, ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha.
PRO 29:17 Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ. Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị.
PRO 29:18 Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro, ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
PRO 29:19 Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị, nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ.
PRO 29:20 Olileanya dịrị onye nzuzu karịa onye ahụ na-adịghị echezi echiche tupu o kwuo okwu.
PRO 29:21 Ị malite na mbụ na-emezi onye na-ejere gị ozi, ọ ga-emesịa chọọ ka i meere ya dịka nwa gị.
PRO 29:22 Onye na-ewe iwe na-akpali ọgụ, onye na-ewe iwe ọkụ na-eme ọtụtụ mmehie.
PRO 29:23 Nganga mmadụ na-eme ka ọ daa, ma mmadụ ahụ dị umeala nʼobi ga-eweta nsọpụrụ.
PRO 29:24 Ndị ọbụla na-enyere ndị ohi aka bụ ndị iro nke ndụ ha, a na-edu ha nʼịṅụ iyi, ma ha adịghị agba akaebe.
PRO 29:25 Ịtụ egwu mmadụ bụ ihe ịma nʼọnya, ma onye ọbụla na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọ nʼudo.
PRO 29:26 Ị chọrọ ikpe ziri ezi? Elela onye ikpe anya nʼihu, kama gwa Onyenwe anyị maka ya.
PRO 29:27 Onye ezi omume na-akpọ ajọ omume asị; ndị na-emebi iwu na-akpọ onye ndụ ya ziri ezi asị.
PRO 30:1 Ndị a bụ okwu Agọ, nwa Jake, onye Masa, Okwu si nʼọnụ nwoke a zigaara Itiel na Ukal: “Ike agwụla m, Chineke ma a pụrụ imeri.
PRO 30:2 Nʼezie, abụ m onye nzuzu karịa mmadụ ọbụla; Enweghị m ụdị nghọta ahụ mmadụ na-enwe.
PRO 30:3 Amụtabeghị m amamihe, maọbụ ruo ịmata maka Onye Nsọ ahụ.
PRO 30:4 Olee onye na-arịgo nʼeluigwe na-arịdatakwa? Onye ka ọ bụ, bụ onye jikọtara ifufe nʼaka ya? Onye kwa weere akwa kechikọtaa osimiri niile nʼaka ya? Onye hiwere oke nsọtụ ụwa niile? Onye ka ọ bụ? Ọ bụrụ na ị ma onye ọ bụ, gịnị bụ aha ya? Gịnịkwa bụ aha nwa ya?
PRO 30:5 “Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha, Ọ bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
PRO 30:6 Atụkwasịla ihe ọbụla nʼokwu ya, ka ọ ghara ịbara gị mba, ka ị gharakwa ịghọ onye ụgha.
PRO 30:7 “O Onyenwe anyị, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ; ajụkwala imere m ha:
PRO 30:8 Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ. Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya, kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile.
PRO 30:9 Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke, ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’ Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi, site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere.
PRO 30:10 “Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu, ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị.
PRO 30:11 “Ọ dị ndị na-akọcha nna ha, ha adịghị agọzikwa nne ha;
PRO 30:12 Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru.
PRO 30:13 Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu, ndị ile anya ha jupụtara na nlelị.
PRO 30:14 Ndị eze ha niile bụ mma agha ịkịrị eze ha bụkwa mma maka irichapụ ndị ogbenye site nʼụwa na ndị nọ nʼụkọ site nʼetiti mmadụ.
PRO 30:15 “Etu nwere ụmụ nwanyị abụọ ndị na-eti, ‘Nye, nye.’ “Ọ dị ụzọ ihe atọ nke afọ na-adịghị eju. E, anọ dị na-adịghị asị, ‘O zuola.’
PRO 30:16 Ala ili, akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime, ala nke mmiri na-adịghị eju afọ, na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’
PRO 30:17 “Onye ahụ na-akwa nna ya emo, nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị, ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya, udele ga-erikwa anụ ahụ ya.
PRO 30:18 “Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha; mbaa, ha dị anọ!
PRO 30:19 Otu ugo si efegharị na mbara eluigwe; otu agwọ si akpụ nʼelu nkume, otu ụgbọ mmiri si achọta ụzọ ya nʼoke osimiri; na otu ịhụnanya si eto nʼetiti nwoke na nwaagbọghọ.
PRO 30:20 “Nke bụ ụzọ nwanyị na-akwa iko, Ọ na-eri ma hichaa ọnụ ya, na-asị, ‘E meghị m ajọ ihe ọbụla.’
PRO 30:21 “Ọ dị ihe atọ na-eme ka ụwa maa jijiji, nʼokpuru ihe anọ nke ọ na-apụghị ịnagide,
PRO 30:22 Ohu ghọrọ eze, onye nzuzu ihe na-agara nke ọma,
PRO 30:23 nwanyị obi ilu mesịrị lụta dị, na odibo nwanyị ghọrọ nwunye nna ya ukwu.
PRO 30:24 “Ihe anọ dị nke dị nta nʼelu ụwa, ma ha maa ihe nke ukwuu.
PRO 30:25 Ndanda bụ ndị na-enweghị ume, ma ha na-akpakọta nri ha, dozie nke ha ga-eri nʼoge oyi.
PRO 30:26 Ewi nkume bụ ndị na-adịghị ike, ma ha na-echebe onwe ha site nʼibi nʼọgba nkume.
PRO 30:27 Igurube enweghị eze, ma ha na-aga nʼigwe nʼahịrị nʼahịrị.
PRO 30:28 Ngwere dị mfe iji aka jide ya, ma ị ga-achọta ha ọ bụladị nʼụlọ ndị eze.
PRO 30:29 “Ha dị ihe atọ na-ejegharị nʼụwa nʼọnọdụ ịdị oke ebube, mbaa, ha dị anọ:
PRO 30:30 Ọdụm, eze ụmụ anụmanụ. Ọ naghị atụ onye ọbụla egwu,
PRO 30:31 na oke ọkụkọ na-ejegharị ejegharị, na mkpi, na eze ndị agha ya gbara gburugburu.
PRO 30:32 “Ọ bụrụ na i meela ihe nzuzu site nʼifuli onwe gị elu maọbụ zube nzube ọjọọ, anyala isi nʼihi ya, were aka gị kpuchie ọnụ gị nʼihere.
PRO 30:33 A pịaa mmiri ara ehi a na-ewepụta mmanụ ara ehi; iti mmadụ aka nʼimi na-akpata ịgba ọbara, otu a kwa ikpali iwe na-eweta ise okwu.”
PRO 31:1 Ndị a bụ okwu si nʼọnụ Lemuel, eze Masa. Ha bụ okwu ndị ahụ nne eze Lemuel kuziri ya.
PRO 31:2 Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m. Gee ntị, nwa m, nwa nke ọziza ekpere m niile.
PRO 31:3 Enyela ụmụ nwanyị ike gị, enyekwela ịdị ike gị nʼaka ndị nʼala ndị eze nʼiyi.
PRO 31:4 Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze.
PRO 31:5 Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru. Ka ha gharakwa isite nʼịṅụbiga mmanya oke napụ ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ha kwesiri inweta.
PRO 31:6 Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi, ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi.
PRO 31:7 Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha, ka ha gharakwa icheta ọnọdụ nhụju anya ha.
PRO 31:8 Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha; kwuchitekwa ọnụ ndị niile ọnọdụ ha dị ala.
PRO 31:9 Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi. Gbooro ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa ọgụ site nʼaka ndị na-emegbu ha.
PRO 31:10 Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya? Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi.
PRO 31:11 Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya, ọ dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya.
PRO 31:12 Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
PRO 31:13 Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ.
PRO 31:14 Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya dịka a ga-asị na ọ bụ ụgbọ mmiri.
PRO 31:15 Tupu chi abọzie, nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri, ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.
PRO 31:16 Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya. Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị.
PRO 31:17 Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya. Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche.
PRO 31:18 Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa; ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.
PRO 31:19 Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa; mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.
PRO 31:20 Ọ na-agbasapụ aka inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.
PRO 31:21 Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi.
PRO 31:22 Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina, ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo dụọ.
PRO 31:23 Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ebe ọ na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ.
PRO 31:24 Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu, ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ.
PRO 31:25 Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ. Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.
PRO 31:26 Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.
PRO 31:27 Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya, ọ naghị arụ ọrụ umengwụ.
PRO 31:28 Ụmụ ya na-ebili gọzie ya; otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.
PRO 31:29 Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha, ma gị onwe gị kachasị ha niile mma.”
PRO 31:30 Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.
PRO 31:31 E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara. Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo.
ECC 1:1 Okwu onye ozizi, nwa Devid, onye bụ eze na Jerusalem.
ECC 1:2 Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu ka onye ozizi na-ekwu. Ihe na-enweghị isi ka ihe niile bụ. Ihe niile bụ nnọọ ihe efu.
ECC 1:3 Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ?
ECC 1:4 Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa, ma ụwa na-adịgide ruo ebighị ebi.
ECC 1:5 Anyanwụ na-awa, na-adakwa, ma mee ngwangwa laghachi ebe o si awapụta.
ECC 1:6 Ifufe na-efe gaa na ndịda; feekwa gburugburu gaa nʼugwu, ọ na-efegharị gburugburu ebe niile; na-efe na-enweghịkwa nsọtụ.
ECC 1:7 Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri ma oke osimiri ejughị eju. Emesịakwa, mmiri ndị a na-alọghachi nʼiyi ndị a, malitekwa ịsọkwa na-aga nʼosimiri.
ECC 1:8 Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ; ọnụ apụghị ịkọ ụdị ike ọgwụgwụ dịnụ. Otu ọbụla anyị si lee anya, afọ adịghị eju anya anyị. Afọ adịghịkwa eju ntị anyị ịnụ ihe, na ige ntị.
ECC 1:9 Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ. Ihe ndị mmadụ mere nʼoge gara aga ka a ga-emekwa ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọhụrụ ọbụla dị nʼokpuru anyanwụ.
ECC 1:10 Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị, “Lee, ihe a bụ ihe ọhụrụ”? Ọ bụ ihe dịịrị nʼoge gara aga, nʼoge ndị garalarị tupu oge anyị.
ECC 1:11 Anaghị echeta ndị mgbe ochie, otu aka ahụ kwa, ọgbọ na-abịa abịa ndị ga-eso ha agakwaghị echeta ha.
ECC 1:12 Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem.
ECC 1:13 Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ?
ECC 1:14 Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe.
ECC 1:15 Ihe gbagọrọ agbagọ, apụghị ime ya ka ọ dizie. Ihe na-ezughị ezu, enweghị ike ịgụta ha ọnụ.
ECC 1:16 Echere m nʼime obi m sị, “Lee anya! Aghọọla m onye ukwu, bụrụ onye maara ihe karịa ndị eze niile chịrịla na Jerusalem. Enweela m amamihe nʼebe ọ dị ukwu, babigakwa ụba oke nʼihe ọmụma.”
ECC 1:17 Nʼihi ya, agbalịsiri m ike ịmụta ihe dị iche nʼetiti ihe ọmụma, na ịyị ara na nzuzu. Ma ihe m chọpụtara bụ na ọ baghị uru. Ọ dị ka itufu oge ịchọ ụzọ ijide ifufe.
ECC 1:18 Nʼihi na mgbe amamihe na-aba ụba, mgbe ahụ ka iwe na ọnụma na-ejupụta, oke ihe ọmụma na-ewetakwa oke ihe mgbu.
ECC 2:1 Echere m nʼime obi m sị, Ugbu a, aga m eji ihe na-enye obi aṅụrị nwaa gị site otu a chọpụta ihe dị mma, ma nke a bụkwa ihe efu.
ECC 2:2 “Ọchị,” ka m sịrị na “ọ bụ ihe nzuzu. Ikpori ndụ, uru gịnị ka ọ bara?”
ECC 2:3 Echere m nʼobi ụtọ m ga-esite nʼịṅụ mmanya. Agbasokwara m ụzọ ibi ndụ nzuzu ma obi m nọ nnọọ na-edu m site nʼamamihe. Olileanya m bụ na m ga-esi otu a chọta ụzọ kachasị mma ndị mmadụ nwere ike iji bie mkpụmkpụ ndụ ha nʼụwa.
ECC 2:4 Arụpụtara m ọtụtụ ihe dị iche iche, ewuru m ụlọ nye onwe m ma nweekwa ubi vaịnị.
ECC 2:5 Ewuru m ubi a gbara ogige ebe izuike, ma kụọkwa osisi na-amị mkpụrụ dị iche iche nʼime ha,
ECC 2:6 wuore onwe m ọdọ mmiri ebe a ga-esi na-agba ubi m niile mmiri.
ECC 2:7 Agbatara m ndị ohu nwoke na nwanyị, nweekwa ndị ohu ọzọ a mụrụ nʼụlọ m. Enwekwara m ọtụtụ igwe ehi na anụ ụlọ karịa eze niile ndị bu m ụzọ chịa na Jerusalem.
ECC 2:8 Achịkọtara m ọlaọcha na ọlaedo nye onwe m, na akụnụba nke ọtụtụ ndị eze na-achị ala ha na-atụtara m. E nwetakwara m nye onwe m ndị ikom na ndị inyom ndị na-abụ abụ. Enwekwara ndị iko nwanyị nʼebe ọ bara ụba. Ihe ụtọ niile ndị na-amasị obi nwa mmadụ.
ECC 2:9 E, aghọrọ m onye dị ukwuu karịa eze niile ndị burula m ụzọ chịa na Jerusalem. Ma nʼime ihe ndị a niile, anya doro m, ihe niile ka m ji amamihe tulee.
ECC 2:10 Ihe ọbụla m chọrọ, ka m na-ewere; egbochighị m onwe m aṅụrị ọbụla. Obi m ṅụrịrị ọṅụ site nʼọrụ niile, nke a bụkwa oke m ketara na ndọgbu niile m dọgburu onwe m.
ECC 2:11 Mgbe m tulere ihe banyere ihe ndị a niile m tinyetụrụ aka, otu m si dọgbuo onwe m nʼọrụ banyere ha, mkpebi m bụ na ha niile bụ ihe efu, dịka ịchọ ijide ifufe. Nʼezie, ihe niile bụ ihe efu, ha abakwaghị uru.
ECC 2:12 Atụgharịrị m bido ịmụ ihe banyere amamihe, na ịyị ara na nzuzu. Olee ihe ọzọ nke onye ga-anọchi anya eze ga-eme, karịa ihe ndị ahụ e merela na mbụ?
ECC 2:13 Achọpụtara m na amamihe dị mma karịa nzuzu, dịka ìhè si dị mma karịa ọchịchịrị.
ECC 2:14 Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ ma isi kpuru onye nzuzu. Ma achọpụtakwara m na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu.
ECC 2:15 Agwara m onwe m okwu sị, “Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ. Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?” Ekwuru m nʼobi m sị, “Ihe a bụkwa ihe efu.
ECC 2:16 Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu. Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha. Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.”
ECC 2:17 Ya mere, akpọrọ m ịdị ndụ asị, nʼihi na ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ wutere m. Ihe efu ka ọ bụ; ọ dị ka ịchụgharị ifufe.
ECC 2:18 Ihe niile m gbalịrị ịrụpụta ka m kpọrọ asị, nʼihi na amaara m na emesịa, aga m ahapụrụ ha onye ọzọ na-abịa nʼazụ m.
ECC 2:19 Onye maara ma ọ ga-abụ onye maara ihe ma ọ ga-abụkwanụ onye nzuzu? Ma ihe niile m ji amamihe ǹka m na ike m rụpụta nʼokpuru anyanwụ ga-abụ nke ya! Ihe a bụ ihe efu.
ECC 2:20 Ya mere, o wutere m nʼobi na m dọgburu onwe m nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ.
ECC 2:21 Nʼihi na mmadụ nwere ike jiri amamihe, na ihe ọmụma na ǹka dọgbuo onwe ya nʼọrụ, emesịa, ha ahapụrụ onye na-enweghị mgbe ọ rụrụ ọrụ ọbụla ihe ndị ahụ niile. Nke a bụkwa ihe efu, na oke ihe ndakwasị.
ECC 2:22 Gịnị bụ uru mmadụ na-enweta na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ?
ECC 2:23 Nʼihi nʼụbọchị ha niile jupụtara naanị nʼihe mgbu na iru ụjụ, ọ bụladị nʼabalị, obi ha anaghị ezu ike. Ihe ndị a bụkwa ihe efu.
ECC 2:24 Nʼihi ya, ekpebiri m na ọ dịghị ihe ọzọ ga-abara mmadụ uru karịakwa naanị ịnọdụ ala rie nri, ṅụọkwa ihe ma chọta ojuju afọ nʼọrụ ya. Achọpụtakwara m na ọ bụladị nke a si nʼaka Chineke.
ECC 2:25 Ọ dịghị onye pụrụ iri maọbụ ṅụọ ma o siteghị na Chineke?
ECC 2:26 Nʼihi na ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, ka Chineke na-enye amamihe na ihe ọmụma, na ọṅụ; ma ọ na-enye onye mmehie ọrụ ịkpakọta na ịchịkọba akụnụba nke ọ ga-enyefe nʼaka onye ahụ ihe ya dị Chineke mma. Nke a bụkwa ihe efu; ịchụso ifufe.
ECC 3:1 Ihe ọbụla nwere oge; mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe.
ECC 3:2 Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ, oge ịkụ ihe na oge ihopu,
ECC 3:3 oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa, oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi,
ECC 3:4 oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị, oge iru ụjụ na oge ite egwu,
ECC 3:5 oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume, oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ,
ECC 3:6 oge ịchọ ihe, na oge ntufu, oge ịchịkọba, na oge ichifusi,
ECC 3:7 oge ndọwasị, na oge ndụkọta, oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu,
ECC 3:8 oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị, oge ibu agha, na oge ime udo.
ECC 3:9 Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ?
ECC 3:10 Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke.
ECC 3:11 O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ.
ECC 3:12 Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile.
ECC 3:13 Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.
ECC 3:14 Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya.
ECC 3:15 Ihe ọbụla dị ugbu a, adịlarị na mgbe ochie, ihe ọbụla gaje ịdị dịlarị na mbụ. Chineke na-eme ka ihe niile mere na mgbe gara aga megharịakwa ọzọ.
ECC 3:16 Ọzọkwa, achọpụtara m otu ihe nʼokpuru anyanwụ, na ọnọdụ ezi ikpe naanị mmebi iwu jupụtara, nʼebe e kwesiri inwe ikpe ziri ezi ị ga-achọpụta na ihe ọjọọ dịkwa ya.
ECC 3:17 A gwara m onwe m, “Chineke ga-ekpe, ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe, nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme, oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe.”
ECC 3:18 Echere m nʼobi sị, “Ebe mmadụ nọ, Chineke na-anwale ya, ka mmadụ mata na ha dị ka anụmanụ.
ECC 3:19 Nʼihi na ihe na-eche mmadụ na anụmanụ bụ otu. Ha abụọ na-eku ume, ha abụọ na-anwụkwa anwụ. Ọ dịghị ihe mmadụ ji karịa anụmanụ. Ihe niile bụ ihe efu.
ECC 3:20 Ha niile na-alaghachi nʼotu ebe; ọ bụ nʼaja ka ha si pụta, ebe ahụ kwa ka ha ga-alaghachi.
ECC 3:21 Onye pụrụ iguzo gbaa akaebe na mmụọ mmadụ na-ala nʼelu ma nke anụmanụ na-ala nʼaja?”
ECC 3:22 Nʼihi ya, ahụrụ m na ọ dịghị ihe ọzọ ụmụ mmadụ kwesiri ime karịakwa inwe ọṅụ nʼọrụ ha, nʼihi na nke ahụ bụ oke ha nʼebe a. Onye ga-eme ka ha bịaghachi hụ ihe ga-eme nʼazụ ha?
ECC 4:1 Ọzọ, ahụrụ m mmegbu na obi ilu niile dị nʼokpuru anyanwụ, anya mmiri akwa ndị a na-emegbu emegbu, ma ọ dịkwaghị ndị nkasiobi ha nwere, ma ike dị nʼaka ndị mmegbu a, ma ha enwekwaghị ndị nkasiobi.
ECC 4:2 Nʼihi ya, ekwuru m, na ndị nwụrụ anwụ, bụ ndị nwụrụ anwụ mgbe gara aga, ka ndị dị ndụ mma, bụ ndị nke dị ndụ ruo ugbu a.
ECC 4:3 Ma ọ dị mma karịa ha abụọ bụ onye ahụ a na-amụbeghị, onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ nke dị nʼokpuru anyanwụ.
ECC 4:4 Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe.
ECC 4:5 Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata, na-eri anụ ahụ onwe ya.
ECC 4:6 Ọ ka mma inwe ihe ntakịrị na obi udo, karịa mmadụ inweju akụ site nʼịdọgbu onwe ya nʼọrụ, nke bụ naanị ịchụso ifufe.
ECC 4:7 Ọ dịkwa ihe ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ bụ naanị ihe efu.
ECC 4:8 Ọ dị otu nwoke nke naanị ya nọ, o nweghị nwa, o nwekwaghị ụmụnne. Mgbe niile, ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ, ma nke a emeghị ka afọ ju ya nʼakụnụba o nwere. Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ nʼihi onye ka m ji adọgbu onwe m nʼọrụ,” “nʼihi gịnị ka m ji anapụ onwe m ihe obi aṅụrị?” Ihe nke a enweghị isi, ihe efu na-eweta obi mgbawa ka ha bụ.
ECC 4:9 Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye, nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:
ECC 4:10 Otu onye nʼime ha daa, onye nke ọzọ ga-apalite ya. Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye, onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu.
ECC 4:11 Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?
ECC 4:12 Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo, ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha. Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.
ECC 4:13 Ọ ka mma ịbụ nwantakịrị na onye ogbenye nwere nghọta karịa ịbụ agadi bụ eze ndị nzuzu, onye na-adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ ọbụla.
ECC 4:14 Nwata dị otu a, ma eleghị anya, ọ ga-esi nʼụlọ mkpọrọ pụta bụrụ eze, ma ọ bụkwanụ na a mụrụ ya ogbenye nʼalaeze ahụ.
ECC 4:15 Ahụrụ m na mmadụ niile ndị bi nʼokpuru anyanwụ na-eso nwantakịrị ahụ onye nọchiri anya eze.
ECC 4:16 A pụghị ịgụta ndị dịnyere ya, ma ndị ga-esota nʼazụ agaghị enwe ọṅụ nʼebe onye nọchiri eze ahụ nọ. Ọzọkwa, nke a bụ ihe efu, naanị ịchụso ifufe.
ECC 5:1 Mgbe ị na-aba nʼụlọ ukwu Chineke, lezie anya. Meghee ntị gị nke ọma, karịa ịchụ aja onyinye nke ndị nzuzu, ndị na-amaghị na ha na-eme ihe ọjọọ.
ECC 5:2 Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị, maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu. Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe ma naanị nʼụwa ka ị nọ, nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole.
ECC 5:3 Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ, otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ.
ECC 5:4 Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke.
ECC 5:5 Ọ ka mma na ị gbara nkịtị karịa na ị ga-ekwe nkwa ma ị gaghị emezu ya.
ECC 5:6 Ekwela ka ọnụ gị duba gị na mmehie. Azọkwala onwe gị site nʼịgwa onyeozi Chineke, “na i kwere nkwa a na-amaghị ama.” Nʼihi gịnị ka Chineke ga-eji wee iwe nʼihi ihe ị kwuru, ma bibiekwa ọrụ aka gị?
ECC 5:7 Aga m eme, aga m eme, ma e meghị ya bụ naanị okwu efu. Ya mere, tụọ egwu Chineke.
ECC 5:8 Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu ndị ogbenye, na-anapụkwa ha ihe ruru ha site nʼikpe ikpe na-ezighị ezi na mpaghara obodo a na-achị achị, ya ejula gị anya, nʼihi na onyeisi ọbụla nwere onye na-atụrụ ya. Ndịisi na-atụ iwu nwekwara ndị kachasị ha elu. Otu a kwa, ọ dịkwa ndị dị elu karịa ha.
ECC 5:9 Mgbe ihe nnweta si nʼala ubi bara ụba, ọ na-abara onye ọbụla uru; ọ na-abakwara eze nʼonwe ya uru.
ECC 5:10 Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ. Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla. Nke a bụkwa ihe efu.
ECC 5:11 Akụ na-abawanye, ndị na-eri ya na-abawanyekwa. Olee uru ha bara nye onyenwe ha karịa iji anya ya abụọ na-ele ha?
ECC 5:12 Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma, ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu, ma oke iriju afọ onye ọgaranya anaghị ekwe ya rahụ ụra.
ECC 5:13 Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ, mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu,
ECC 5:14 ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ, o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa.
ECC 5:15 Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa, otu a ka anyị ga-esi hapụ ya. O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ.
ECC 5:16 Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi. Mmadụ na-ala dịka o siri bịa. Gịnị bụ uru ya, mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe?
ECC 5:17 Ụbọchị ndụ ya niile, ọ na-eri ihe nʼọchịchịrị, site oke mgbagwoju anya, na nsogbu na iwe.
ECC 5:18 Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe dị mma na ihe kwesiri omume, ka nwoke rie ihe ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ Ka ọ chọtakwa afọ ojuju nʼime ndọgbu niile nke ọrụ ọ ruru nʼokpuru anyanwụ, nʼoge mkpụmkpụ ndụ nke Chineke nyere ya. Nʼihi na nke a bụ oke ya.
ECC 5:19 Ọzọkwa, ọ bụrụ na Chineke enye mmadụ akụnụba na ihe nweta, ma nyekwa ya ike ọ ga-eji kporie ndụ nʼime ihe ndị a, ya nabata nke a dị ka oke ya ma were ọṅụ rụọ ọrụ ya. Ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.
ECC 5:20 Ebe ọ bụ na Chineke enyela ya obi ụtọ, ụbọchị ndụ ya ekwesighị iwetara ya oke echiche.
ECC 6:1 Ọ dị ihe ọjọọ ọzọ nke m hụrụ nʼokpuru anyanwụ, nke na-anyịdo ụmụ mmadụ.
ECC 6:2 Chineke na-enye mmadụ akụnụba, na ihe nnweta, na nsọpụrụ, na-emekwa ka ha nwee ihe niile ha chọrọ, ma ọ dịghị enye ha ike ịnụ ụtọ ha; ma onye ọzọ na-anụ ụtọ ha. Nke a bụ ihe efu, bụrụkwa ihe jọgburu onwe ya.
ECC 6:3 Mmadụ nwere ike mụta narị ụmụ, o nwekwara ike nwee ndụ ogologo ruo agadi, ma ọ bụrụ na o nweghị ike ịnụ ụtọ akụnụba ya, ọ bụrụkwa na o nwetaghị ụdị olili ruru ya, ana m asị, na nwa nwụrụ nʼafọ dị mma karịa ya.
ECC 6:4 Ọbịbịa ya e nweghị isi, nʼọchịchịrị ka ọ na-ala, ọ bụkwa ọchịchịrị ka e kpuchiri aha ya.
ECC 6:5 Ọ bụ ezie na ọ gaghị ahụ ihe anwụ anya, ọ makwaghị ihe ọbụla, o nwere izuike karịa nwoke ahụ.
ECC 6:6 A sịkwarị na o biri ndụ puku afọ, okpukpu abụọ, ma ọ nụghị ụtọ akụnụba ya. Ọ bụghị nʼotu ebe ka ha niile na-ala?
ECC 6:7 Ndọgbu niile mmadụ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ bụ ka o rijuo afọ, ma o nweghị onye na-enweta ihe na-ezuru ya.
ECC 6:8 Olee ụzọ onye maara ihe si dị mma karịa onye nzuzu? Gịnị bụ uru dịịrị onye ogbenye na ọ maara otu e si akpa ezi agwa nʼihu ndị dị ndụ?
ECC 6:9 Ihe eji anya hụ ka mma karịa oke ọchịchọ! Nke a bụkwa ihe efu na ịchụso ifufe.
ECC 6:10 Ihe ọbụla dị ugbu a, ka akpọrọ aha na mgbe gara aga. Amakwaara ihe mmadụ bụ, mmadụ ọbụla apụghị ịlụso onye ka ya ike ọgụ.
ECC 6:11 Okwu na-aba ụba, nghọta na-adị nta. O nwere uru nke a bara?
ECC 6:12 Onye mara ihe dịrị mmadụ mma na ndụ, nʼụbọchị ole na ole nke na-abaghị uru o nwere ịgabiga ndụ a dịka onyinyo? Onye pụrụ ịgwa ya ihe ga-eme nʼokpuru anyanwụ, mgbe ọ nwụsịrị?
ECC 7:1 Ezi aha ka mma karịa mmanụ isi ụtọ. Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma.
ECC 7:2 Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụ karịa ebe a na-eri na-aṅụ. Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla; ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi.
ECC 7:3 Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma, ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka
ECC 7:4 Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ, ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ.
ECC 7:5 Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ.
ECC 7:6 Ọchị onye nzuzu dị ka mkpọtụ nke ogwu na-ere ọkụ na-eme nʼokpuru ite. Ihe a bụkwa ihe efu.
ECC 7:7 Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu, iri ngarị na-emerụ obi mmadụ.
ECC 7:8 Ọgwụgwụ ihe ọbụla dị mma karịa mmalite ya! Ogologo ntachiobi dị mma karịa mpako!
ECC 7:9 Abụla onye na-ewe iwe ọsịịsọ, nʼihi na iwe bụ oke ndị nzuzu.
ECC 7:10 Asịla, “Gịnị mere ụbọchị gara aga ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?” Nʼihi na ọ bụghị amamihe ị jụ ajụjụ dị otu a.
ECC 7:11 Amamihe dịka ihe nketa, bụ ihe dị mma. Ọ na-abara uru nye ndị na-ahụ anyanwụ anya.
ECC 7:12 Amamihe bụ ndo dịka ego si bụrụkwa ndo, ma ụzọ ihe ọmụma ji dị mma karịa bụ nke a: Amamihe na-echebe ndụ ndị nwere ya.
ECC 7:13 Chee echiche banyere ihe Chineke na-eme. Mmadụ ọ pụrụ ime ka ọ dịzie adịzie, bụ ihe Chineke mere ka ọ gbagọọ agbagọ?
ECC 7:14 Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma, ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọma na Chineke onye na-enye ọnọdụ ọma makwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ. Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụta ọdịnihu ya.
ECC 7:15 Ndụ m nʼụwa a bụ ihe efu, ahụla m ihe abụọ ndị a; onye ezi omume na-anwụ nʼezi omume ya, ma onye na-emebi iwu na-ebi ogologo ndụ na mmebi iwu ya.
ECC 7:16 Nʼihi ya, abụbigala onye ezi omume oke, emekwala onwe gị onye mabigara ihe oke. Gịnị mere i ji achọ igbu onwe gị?
ECC 7:17 Abụbigala onye na-emefe ajọ omume oke, abụkwala onye nzuzu! Gịnị ka ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị?
ECC 7:18 Ọ dị mma ijide otu na-esepụghị aka na nke ọzọ, onye na-atụ egwu Chineke ga-enweta uru nʼime ha abụọ.
ECC 7:19 Amamihe na-eme ka otu onye dị ike karịa mmadụ iri na-achị otu obodo.
ECC 7:20 Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla.
ECC 7:21 Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu, ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị.
ECC 7:22 Gị onwe gị maara na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ.
ECC 7:23 Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị, “Aga m abụ onye amamihe,” ma nke a karịrị m.
ECC 7:24 Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu; ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya?
ECC 7:25 A tụgharịrị uche m ka m ghọta, iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume na ịyị ara nke dị na enweghị uche.
ECC 7:26 Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ, ihe ahụ bụ nwanyị. Obi ya dị ka ụgbụ. Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe. Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ, ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya.
ECC 7:27 “Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru: “Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile.
ECC 7:28 Mgbe m ka na-achọ ma achọtaghị m, nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha, ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha.
ECC 7:29 Achọpụtara m naanị nke a, Chineke mere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ụzọ ha ziri ezi, ma ha atụgharịala chọrọ ọtụtụ ihe nchepụta gawa.”
ECC 8:1 Onye dị ka onye amamihe? Onye maara nkọwa ihe? Amamihe na-enyekwa ihu ya ihe, na-emekwa ka mgbarụ nke ihu ya gbanwee.
ECC 8:2 Asị m, debe iwu eze, nʼihi iyi ị ṅụrụ nʼihu Chineke.
ECC 8:3 Emela ngwangwa isi nʼihu eze pụọ. Akwagidela ihe ọjọọ nʼihi na ọ ga-eme ihe masịrị ya.
ECC 8:4 Nʼihi na okwu eze nwere ike ọ dịghị onye pụrụ ịjụ ya, Gịnị ka ị na-eme?
ECC 8:5 Onye na-edebe iwu eze agaghị adaba na nsogbu. Onye maara ihe na-ama mgbe kwesiri na ụzọ kwesiri ime ihe.
ECC 8:6 Ihe niile nwere oge kwesiri ya, ụzọ e si eme ha dịkwa, ọ bụ ezie na nsogbu mmadụ dị ukwuu nʼahụ ya.
ECC 8:7 Ebe ọ bụ na o nweghị onye mara ihe na-aga ime, onye pụrụ ịgwa ibe ya ihe gaje ime?
ECC 8:8 Ọ dịghị onye nwere ike igbochi mmụọ mmadụ mgbe ọ chọrọ. Ọ dịghị onye nwere ike igbochi ụbọchị ọnwụ ya. Dịka o si sie ike izighachi mmadụ azụ nʼoge agha, otu a ka o si sie ike ajọ omume ịtọghapụ ndị na-eme ihe ọjọọ.
ECC 8:9 Ihe ndị a niile ka m hụrụ, mgbe m na-atụgharị uche banyere ihe niile a na-eme nʼokpuru anyanwụ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-emegide ibe ya si otu a wetara onwe ya nsogbu.
ECC 8:10 Ọzọkwa, ahụrụ m ebe e liri ndị ajọ omume, ndị na-abata na apụkwa site nʼebe dị nsọ, a na-etokwa ha nʼobodo ebe ha mere ihe ndị a. Nke a bụkwa nnọọ ihe na-enweghị isi; ihe efu.
ECC 8:11 Nʼihi na e nyeghị ntaramahụhụ mmehie mgbe o kwesiri, obi ndị mmadụ na-ejupụta nʼatụmatụ ime mmehie.
ECC 8:12 Onye ajọ omume nwere ike mee narị mmehie bikwaa ogologo ndụ, ma amara m na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma karịa, bụ ndị na-atụ egwu nʼihu Chineke.
ECC 8:13 Nʼihi na ndị ajọ omume adịghị atụ egwu Chineke, ọ gaghị adịrị ha na mma, ụbọchị ndụ ha agaghị agbatịkwa ogologo dịka onyinyo.
ECC 8:14 Ọ dị ihe ọzọ na-enweghị isi nʼụwa: ndị ezi omume na-anata ntaramahụhụ dịrị ndị na-emebi iwu. Ndị na-emebi iwu na-anata ụgwọ ọrụ ruru ndị ezi omume. Nʼezie, ihe ndị a niile bụ ihe efu, ha enweghị isi.
ECC 8:15 Ya mere, ana m ekwupụta, na ikpori ezi ndụ dị mma, nʼihi na ọ dịghị ihe ka mma nye mmadụ nʼokpuru anyanwụ, karịa iri, na ịṅụ, na inwe obi ụtọ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe obi ụtọ nʼọrụ ọ na-arụ nʼụbọchị niile nke Chineke nyere ya nʼokpuru anyanwụ.
ECC 8:16 Mgbe m wepụtara obi m ịchọ amamihe na ịghọta ọrụ mmadụ nʼokpuru anyanwụ nke mere na ọ naghị ehi ụra ehihie na abalị,
ECC 8:17 mgbe ahụ ka m chọpụtara ihe Chineke mere. O nweghị onye pụrụ ịghọta ihe na-aga nʼokpuru anyanwụ. Otu ọbụla mmadụ siri gbalịa o nweghị ike ịchọpụta ihe ọ pụtara. Onye maara ihe pụrụ ị sị na a amatala ya, ma nʼezie ọ maghị ya.
ECC 9:1 Ihe ndị a niile ka m tulere nke ọma nʼobi m, kpebie na ihe ndị ezi omume na ndị maara ihe na-eme dị nʼaka Chineke, ma ọ dịghị onye maara ihe na-echere ha maọbụ ịhụnanya maọbụ ịkpọ asị.
ECC 9:2 Ihe niile na-adakwasị mmadụ niile nʼotu ụzọ ahụ, ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, ezi mmadụ na onye na-abụghị ezi mmadụ, onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha, onye na-achụ aja na onye na-adịghị achụ aja. Dịka ọ dịrị ezi mmadụ, otu a ka ọ dịrị onye mmehie; dịka ọ dịrị ndị na-aṅụ iyi, otu a kwa ka ọ dị nye ndị na-adịghị aṅụ.
ECC 9:3 Nke a bụkwa ihe ọjọọ na-eme nʼokpuru anyanwụ. Otu ihe ndakwasị dịrị mmadụ niile. Ọzọkwa, obi ụmụ mmadụ jupụtara nʼihe ọjọọ na ịyị ara mgbe ha nọ na ndụ, emesịa ha alakwuru ndị nwụrụ anwụ.
ECC 9:4 Naanị ndị dị ndụ nwere olileanya. Ọ ka mma ịbụ nkịta dị ndụ karịa ịbụ ọdụm nwụrụ anwụ.
ECC 9:5 Nʼihi na ndị dị ndụ maara nke ọma na ha ga-anwụ, ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọbụla; ha enwekwaghị ụgwọ ọrụ ọzọ, nʼihi na ha bụ ndị echefurula echefu.
ECC 9:6 Ịhụnanya ha, na ịkpọ asị ha, na ekworo ha gabigara mgbe ha nwụrụ. Ha agaghị enwekwa oke nʼihe ọbụla na-eme nʼokpuru anyanwụ.
ECC 9:7 Ya mere, gaa nʼihu, jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa ọṅụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ nʼihi na ọ bụ ugbu a ka Chineke nabatara ọrụ gị.
ECC 9:8 Yiri akwa dị ọcha mgbe niile, tee mmanụ na-esi isi ụtọ nʼisi gị.
ECC 9:9 Bie ndụ obi ụtọ, gị na nwunye gị ị hụrụ nʼanya, ụbọchị niile nke ndụ ihe efu gị nke Chineke nyere gị nʼokpuru anyanwụ, nʼihi na nke a bụ oke dịịrị gị na ndụ ndọgbu onwe gị nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ.
ECC 9:10 Ihe ọbụla ị na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka ị na-aga.
ECC 9:11 Ahụrụ ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-agbata ihe, ọ bụkwaghị onye sikarịrị ike na-emeri nʼagha; ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịrị, ọ bụghị ndị nwere nghọta ka akụnụba dịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nka ka amara na-adịrị; kama ọ bụ mgbe na ihe ndaba na-eme ka ihe ndị a dịrị.
ECC 9:12 Nke ka nke, ọ dịghị mmadụ ọbụla maara mgbe oge ya ga-eru: Ọ dị ka nnụnụ nke mara nʼọnya, maọbụ azụ e jidere nʼụgbụ. Dịka ha, ụmụ mmadụ na-adaba nʼọnya nke ihe ọjọọ mgbe ha na-atụghị anya ya.
ECC 9:13 Ahụkwara m ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, nke a bụ ụdị amamihe nke metụrụ m nʼobi nʼebe ọ dị ukwuu.
ECC 9:14 Ọ dị obodo nke naanị mmadụ ole na ole bi nʼime ya, ma otu eze dị ike chịịrị ndị agha ya bịa ibuso obodo nta a agha. Ndị agha ya gbara obodo a gburugburu na-achọ ịkwatu mgbidi ya.
ECC 9:15 Ma ọ dị otu onye ogbenye bi nʼobodo nta ahụ, onye maara ihe, ọ zọpụtara obodo ahụ site nʼamamihe ya. Ma o nweghị onye chetara ihe banyere ya.
ECC 9:16 Nke a mere m ji sị, inwe amamihe bara uru karịa ịdị ike, ma ọ bụrụ na onye amamihe ahụ bụ onye ogbenye, a ga-eleda ya anya, a gaghị akpọkwa okwu ya ihe.
ECC 9:17 Okwu nke onye maara ihe na-ekwu na nwayọọ ka a na-anụ, karịa iti mkpu nke onye na-achị achị nʼetiti ndị nzuzu.
ECC 9:18 Amamihe ka ihe agha niile mma, ma otu onye mmehie na-ala ọtụtụ ezi ihe nʼiyi.
ECC 10:1 Ijiji nwụrụ anwụ ga-eme ka mmanụ isi ụtọ sie isi ọjọọ. Otu a kwa, nzuzu nta pụrụ ime ka amamihe dị ukwuu ghara inwe nsọpụrụ.
ECC 10:2 Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi, ma obi onye nzuzu na-eduba ya na mmehie.
ECC 10:3 Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya, nʼihi na o maghị ihe. Ọ bụladị onye ọbụla na-achọpụta onye nzuzu ọsịịsọ.
ECC 10:4 Ọ bụrụ na iwe onye ọchịchị ebilie megide gị, ahapụla ọnọdụ gị, nʼihi na mmụọ dị nwayọọ ga-eme ka mmehie ukwu dị iche iche dajụọ.
ECC 10:5 Ọ dịkwa ihe ọjọọ ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ, dịka njehie nke ndị eze na ndị na-achị achị na-ejehie.
ECC 10:6 Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu, ma ndị ọgaranya adịghị enweta ọnọdụ ruuru ha.
ECC 10:7 Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya, ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu.
ECC 10:8 Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya! Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu.
ECC 10:9 Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị. Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha.
ECC 10:10 Ọ bụrụ na anyụike adịghị nkọ, ọ bụrụkwa na-amụghị ihu ya amụ, a ga-etinye ike karịa, ma ịma eme ihe na-eme ka ihe gazie agazi.
ECC 10:11 Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu e kechie ya ọnụ, ọ dịkwaghị uru ọ bara na e kechiri ya ọnụ.
ECC 10:12 Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara, ma okwu onye nzuzu na-eduba ya nʼịla nʼiyi
ECC 10:13 Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu, ọgwụgwụ okwu ya bụkwa naanị mmebi iwu na ịyị ara.
ECC 10:14 Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu. Ma o nweghị onye ma ihe na-aga ime, onye pụrụ ịgwa ya ihe gaje ime mgbe ọ nwụrụ?
ECC 10:15 Ọrụ nke ndị nzuzu na-agwụ ya ike, ha makwaghị ụzọ ijeru obodo.
ECC 10:16 Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị, nke ndị na-achị achị bụ ndị na-akpọ oriri nʼụtụtụ.
ECC 10:17 Ngọzị na-adịrị ala ahụ nke eze ya bụ onye a na-asọpụrụ, nke ụmụ eze ya na-eri ihe mgbe o kwesiri nʼihi inweta ike, ọ bụghị maka ịṅụbiga mmanya oke.
ECC 10:18 Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri; ọ bụkwa umengwụ na-eme ka elu ụlọ malite ize eze.
ECC 10:19 Ịkpọ oriri na-eweta ọnụ ọchị, mmanya na-enye obi ụtọ, ma ego bụ ọsịsa nye ihe niile.
ECC 10:20 Akọchala eze, ọ bụladị nʼechiche obi gị; maọbụ bụọ ọgaranya ọnụ nʼime ụlọ ndina gị, nʼihi na anụ ufe nọ nʼelu nwere ike buru okwu gị nwa nnụnụ nwere nku ga-akọ ihe i kwuru.
ECC 11:1 Gbasapụ aka gị nʼinye onyinye nʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-anata ụgwọ ọrụ gị.
ECC 11:2 Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọ nʼihi na ị maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo.
ECC 11:3 Mgbe eluigwe rujiri, mmiri ga-ezo; mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda, ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ.
ECC 11:4 Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla, onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.
ECC 11:5 Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime, otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke, onye mere ihe niile.
ECC 11:6 Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ, esepụkwala aka nʼanyasị, nʼihi na ị maghị nke ga-eto, maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ, ha niile nwere ike too nke ọma.
ECC 11:7 Ìhè dị ụtọ, ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ.
ECC 11:8 Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ, ya ṅụrịa nʼime ihe niile, ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị ga-adị ọtụtụ. Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu.
ECC 11:9 Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa. Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị. Mee ihe niile ị chọrọ ime; gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ. Kama, ghọtakwa nke a, na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere.
ECC 11:10 Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi, wezugakwa nsogbu nke ahụ gị, nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.
ECC 12:1 Ya mere, cheta Onye kere gị mgbe ị ka bụ okorobịa, tupu ụbọchị ọjọọ ndị ahụ abịa, na mgbe afọ aka abịarubeghị mgbe ị ga-asị, “Ha anaghị atọkwa m ụtọ.”
ECC 12:2 Tupu anyanwụ na ìhè, ọnwa na kpakpando ga-agba ọchịchịrị, na nlọghachi igwe ojii mgbe mmiri zosiri.
ECC 12:3 Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji, mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata, mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole, mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị,
ECC 12:4 mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ, mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala, mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ, ma abụ ha niile na-ala ala,
ECC 12:5 mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu; na ihe egwu nke okporoụzọ, mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ, agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya, ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile.
ECC 12:6 E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ, tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo, tupu ite adawaa nʼisi iyi, tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri.
ECC 12:7 Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta; mmụọ anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya.
ECC 12:8 “Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru. “Ihe niile bụ ihe efu!”
ECC 12:9 Ọ bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe ọ maara. Ọ tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro.
ECC 12:10 Onye ozizi chọpụtara okwu ndị dabanyere nʼusoro, ihe o depụtara bụ ihe ziri ezi na eziokwu.
ECC 12:11 Okwu ọnụ nke onye maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi. Nchịkọta okwu amamihe ndị a dị ka ǹtu a kumiri nke ọma, nke onye na-azụ atụrụ nyere.
ECC 12:12 Ma nwa m nwoke lezie anya, atụkwasịla ihe ọzọ nʼelu ihe ndị a. Akwụkwọ a na-ede ede enweghị ọgwụgwụ, ọtụtụ mmụta na-agwụ ike.
ECC 12:13 Ugbu a anụla ihe ndị a niile, ma nụrụ ihe bụ nkwubi okwu: Tụọ egwu Chineke, debekwa iwu ya niile, nʼihi na nke a bụ ọrụ niile dịrị mmadụ.
ECC 12:14 Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe, ya na ihe nzuzo anyị niile, ma ha dị mma ma ha dị njọ.
SOL 1:1 Abụ nke abụ nke Solomọn.
SOL 1:2 Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ, nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya.
SOL 1:3 Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma, aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta, ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya.
SOL 1:4 Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa. Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya. Ndị Enyi Anyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị. Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya. Onye a hụrụ nʼanya Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu.
SOL 1:5 Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya, unu ụmụ agbọghọ Jerusalem. Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn.
SOL 1:6 Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji. Ọ bụ anwụ gbajiri m. Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m, zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị, ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị.
SOL 1:7 Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya, ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri? Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie? Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị.
SOL 1:8 Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma, soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ.
SOL 1:9 Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnya e kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero.
SOL 1:10 Agba nti gị ka e jiri ọlantị chọọ mma, olu gị kwa ka e jiri nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị chọọ mma.
SOL 1:11 Anyị ga-emere gị ọlantị dị iche iche nke ọlaedo, nke e ji ọlaọcha chọọ mma.
SOL 1:12 Mgbe eze nọ na tebul ya, mmanụ isi ọma m tere sijuru ebe niile.
SOL 1:13 Onye m hụrụ dị m ka ụda máá e kechiri nʼakpa nke dị nʼetiti ara m abụọ.
SOL 1:14 Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko henna nke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.
SOL 1:15 Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya. Leenụ ka ị si maa mma! Anya gị dịka nduru.
SOL 1:16 Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma nwoke. E, ị mara mma. Ebe ndina anyị dịka ahịhịa ndụ.
SOL 1:17 Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida, ntuhie ya bụkwa osisi fịa.
SOL 2:1 Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn, na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu.
SOL 2:2 E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu, otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ.
SOL 2:3 Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa, mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ. Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya, mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ.
SOL 2:4 Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri, ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya.
SOL 2:5 Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume; werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike, nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa.
SOL 2:6 Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m.
SOL 2:7 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị: Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta, ruo mgbe ọ masịrị ya.
SOL 2:8 Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya! Lee ya ka ọ na-abịa, na-amali elu nʼelu ugwu niile, na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile.
SOL 2:9 Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele. Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị, ọ na-esikwa na oghereikuku na nʼoghere dị ya na-elebata anya.
SOL 2:10 Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m, “Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ, onye m mara mma, soro m.
SOL 2:11 Lee, oge oyi agafeela, udu mmiri agabigakwala.
SOL 2:12 Okoko osisi epupụtala nʼala; oge eji agụ egwu eruokwala, a na-anụ abụ nduru nʼala anyị niile.
SOL 2:13 Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ, isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile. Bilie, ma bịa, ọmasịrị m. Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”
SOL 2:14 Nduru m nọ nʼọgba nkume, nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu, gosi m ihu gị, mee ka m nụ olu gị, nʼihi na olu gị dị ụtọ, ihu gị makwara mma.
SOL 2:15 Jidenụ nkịta ọhịa, ụmụ nkịta ọhịa niile na-emebiri anyị ubi, ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko.
SOL 2:16 Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi,
SOL 2:17 tutu chi ụtụtụ abọọ mgbe onyinyo niile na-agabigakwa. Tụgharịa, onye m hụrụ nʼanya, dị ka mgbada maọbụ nwa ele nke nọ nʼelu ugwu.
SOL 3:1 Achọrọ m onye m hụrụ nʼanya nʼelu ihe ndina m nʼabalị, ma ahụghị m ya. Ebiliri m chọọ ya ma ahụghị m ya.
SOL 3:2 Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya, m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya. Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya.
SOL 3:3 Ndị nche na-eche obodo hụrụ m, mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?”
SOL 3:4 Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha, achọtara m onye m hụrụ nʼanya, ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka tutu m duta ya nʼụlọ nne m, nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m.
SOL 3:5 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị, unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta ruo mgbe o masịrị ya.
SOL 3:6 Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa dịka anwụrụ ọkụ, nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ, ụda nke ndị ahịa na-ere?
SOL 3:7 Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn. Iri mmadụ isii ndị ọka agha, ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya.
SOL 3:8 Ha niile ji mma agha; ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha. Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya, ịdị njikere maka ihe egwu abalị.
SOL 3:9 Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ a nke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ.
SOL 3:10 Ogidi ya ka o ji ọlaọcha mee; ala ya bụkwa ọlaedo. Ebe ịnọdụ ọdụ ya ka e ji akwa odo odo kpaa, e ji ịhụnanya dozie ebe ime ya. Ndị inyom Jerusalem,
SOL 3:11 pụtanụ, bịa hụrụ, unu ụmụ agbọghọ Zayọn, bịanụ ka unu hụ Solomọn bụ eze; lee ụdị okpueze nne ya kpunyere ya nʼisi, nʼụbọchị agbamakwụkwọ ya, nʼụbọchị obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ ya.
SOL 4:1 Leenụ ka i si maa mma, onye m hụrụ nʼanya, e, ị mara mma! Anya gị abụọ nke dị nʼazụ akwa mkpuchi ihu gị dị ka nduru. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu nke na-arịda nʼakụkụ ugwu Gilead.
SOL 4:2 Eze gị dị ka igwe atụrụ a ka kpachapụrụ ajị ha ọhụrụ, nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta. Nke ọbụla chi ụmụ abụọ, ọ dịghịkwa nke gba aka nwa nʼetiti ha.
SOL 4:3 Egbugbere ọnụ gị abụọ dị ka ogho uhie. Ọnụ gị dị mma ile anya. Agba nti gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị dị ka pomegranet e kere abụọ.
SOL 4:4 Olu gị dị ka ụlọ elu Devid, nke e wuziri nke ọma. E konyere puku ọta na ya, ha niile bụ ọta nke ndị ọka nʼagha.
SOL 4:5 Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ, nke otu nne mụrụ nʼotu oge, ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi.
SOL 4:6 Tutu chi ụtụtụ abọọ, tutu onyinyo agbalaga, aga m aga nʼugwu ụda máá na nʼugwu insensi.
SOL 4:7 Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya, ọ dịkwaghị ntụpọ ọbụla dị gị nʼahụ.
SOL 4:8 Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ. Si na Lebanọn bịa soro m; rịdata site nʼugwu Amana, nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon, site nʼọgba ọdụm nʼugwu niile ebe agụ bi.
SOL 4:9 I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m; i riela m obi, i werela ile anya gị na ihe olu i yi rie obi m.
SOL 4:10 Lee ka ịhụnanya gị si dị ụtọ, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Lee ka ịhụnanya gị si dị mma nke ukwuu karịa mmanya, isisi ụtọ nke mmanụ otite gị na-esi isi ọma karịa mmanụ ụda ọbụla.
SOL 4:11 Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m, mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị, isisi ụtọ nke uwe gị na-esi ka Lebanọn
SOL 4:12 Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ. Ị bụ isi iyi nke a gbara ogige, rachiekwa.
SOL 4:13 Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet nwere ezi mkpụrụ dị oke ọnụahịa, nke nwere henna na naad,
SOL 4:14 naad na safron, kalamus na sinamọn, na osisi nke ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda máá, na aloos na ụda kachasị mma dị iche iche na-esi isi ụtọ.
SOL 4:15 I bụ isi iyi nke ubi a gbara ogige, olulu mmiri dị ndụ nke si na Lebanọn asọdata.
SOL 4:16 Teta nʼụra gị ifufe si nʼugwu; bịakwa gị ifufe si na ndịda, fekwasị ubi m a gbara ogige, ka isisi ụda ya dị ụtọ fesaa ebe niile, ka onye m hụrụ nʼanya bịa nʼubi ya a gbara ogige, ka ọ bịa rie mkpụrụ dị iche iche dị nʼime ya nke dị oke ọnụahịa.
SOL 5:1 Abatala m nʼubi m a gbara ogige, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Achịkọtala m máá ya na ụda m, arachakwala m mmanụ aṅụ m na ugbugbo mmanụ aṅụ. Aṅụkwala m mmiri ara ehi na mmanya m. Ndị Enyi Rie, ṅụọkwa, unu ndị bụ enyi; ṅụjuo afọ, unu ndị hụrụ onwe unu nʼanya.
SOL 5:2 A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya. Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ. “Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya, nduru m, onye na-enweghị ntụpọ. Igirigi ezokwasịla m nʼisi, agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.”
SOL 5:3 Eyipụlarị m uwe m. Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ? Asaala m ụkwụ m, aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ?
SOL 5:4 Onye m hụrụ nʼanya gbatịrị aka ya imeghe ụzọ, mgbe ahụ, obi m chọsikwara ya ike.
SOL 5:5 Mụ onwe m biliri imeghere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma aka m abụọ jupụtakwara na mmanụ máá, mmanụ máá si na mkpịsịaka m niile na-atapụsi, nʼelu ihe mkpọchi nke ibo.
SOL 5:6 Mgbe m megheere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma lee, ọ nọkwaghị ya, ọ laala. Obi fepụrụ m mgbe ọ pụwara. Elegharịrị m anya chọọ ya ma ahụghị m ya ebe ọbụla. Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị.
SOL 5:7 Ndị nche hụrụ m mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ha tiri m ihe merụọ m ahụ. Ndị nche mgbidi obodo napụrụ m akwa mkpuchi m.
SOL 5:8 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya, gịnị ka unu ga-agwa ya? Gwa ya na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụchasịa nʼahụ.
SOL 5:9 Gị nwanyị kachasị mma, olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ? Olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ nke i ji enye anyị iwu dị otu a?
SOL 5:10 Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya. Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri.
SOL 5:11 Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha, agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ, na-ejikwa nji dịka ugolọma.
SOL 5:12 Anya ya abụọ dịka nduru nọ nʼakụkụ mmiri iyi nke e jiri mmiri ara ehi sachaa, dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị.
SOL 5:13 Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ. Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi, nke na-agbụsị mmanụ máá.
SOL 5:14 Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi, nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya. Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma.
SOL 5:15 Ogwe ụkwụ ya abụọ dị ka ogidi e ji nkume mabụl kpụọ, nke e ji ọlaedo a ṅụchara anụcha tọọ ntọala ha. Ụdịdị ya dị ka Lebanọn, dịkwa oke ọnụ dịka osisi sida ya.
SOL 5:16 Ọnụ ya bụ ihe tọkarịsịrị ụtọ nʼonwe ya, ihe niile banyere ya dị mma nʼile anya. Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, onye dị otu a bụ onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa enyi m.
SOL 6:1 Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom, ebee ka onye ị hụrụ nʼanya jere? Olee ụzọ o sitere? Ka anyị soro gị chọọ ya.
SOL 6:2 Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige, nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ, ijegharị nʼetiti okoko urodi, na ịchịkọta okoko lili.
SOL 6:3 Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi.
SOL 6:4 Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ. Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem; Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ.
SOL 6:5 Wepụ anya gị nʼebe m nọ, nʼihi na i jirila anya gị dọta m. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu nke na-arịdata site nʼugwu Gilead.
SOL 6:6 Eze gị dị ka igwe atụrụ nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta. Nke ọbụla chi ụmụ abụọ, ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha.
SOL 6:7 Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị dị ka pomegranet e kere abụọ.
SOL 6:8 E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii, na iri ndị iko nwanyị asatọ, na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ,
SOL 6:9 ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile. Naanị otu nwanyị nne ya nwere, ọ masịrị onye mụrụ ya. Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi, ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya.
SOL 6:10 Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ, nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ, dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị?
SOL 6:11 Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi, ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu, ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị, na ị mata ma nʼosisi pomegranet ọ mara ifuru.
SOL 6:12 Tupu m mata ebe m nọ, agụ nke mkpụrụobi m adọtala m tinye nʼetiti ụgbọ agha nke ndị eze ala m.
SOL 6:13 Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ; laghachi azụ, e, laghachi azụ ka anyị lee gị anya. Onye hụrụ ibe ya nʼanya Maka gịnị ka unu ga-eji lee onye Shulam anya dịka ọ bụ ite egwu ndị Mahanaim?
SOL 7:1 Lee ka ụkwụ gị si dị mma nʼime akpụkpọụkwụ gị ada nwa eze. Apata ụkwụ gị abụọ dị ezi mma dịka nkume oke ọnụahịa, ọrụ aka nke ezigbo onye ọkwa ǹka.
SOL 7:2 Otubo gị mara mma dịka iko nke a gbajuru mmanya. Ukwu gị dị ka ukwu ọka e ji okoko urodi gbaa gburugburu.
SOL 7:3 Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ nke otu nne mụrụ nʼotu oge.
SOL 7:4 Olu gị guzo kwem dị ka ụlọ elu e ji ọdụ wuo. Anya gị abụọ dị ka ọdọ mmiri Heshbọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-Rabim. Imi gị mara mma dị ka ụlọ elu Lebanọn nke chere Damaskọs ihu.
SOL 7:5 Isi gị guzo nʼahụ gị ka ugwu Kamel. Agịrị isi nke isi gị dịkwa ogho odo odo. Ịma mma nke agịrị isi gị emela eze onye a dọtara nʼagha.
SOL 7:6 Lee ka i si maa mma nke ukwuu, nʼezie, ị mara mma. Ị dịkwa ụtọ nke ukwuu, gị onye m hụrụ nʼanya.
SOL 7:7 Ị dị ogologo dịka osisi nkwụ; ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ osisi.
SOL 7:8 Ekwuru m sị, “Aga m arịgoro elu osisi nkwụ ahụ, jidekwa mkpụrụ ya aka.” Ugbu a, ka ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ vaịnị, ka isisi nke iku ume gị dịkwa ka mkpụrụ osisi apụl,
SOL 7:9 ka okpo ọnụ gị dịka mmanya makarịsịrị na mma. Onye a hụrụ nʼanya Ka mmanya ahụ gbadaa nwayọọ nye onye m hụrụ nʼanya, na-asọda nwayọọ nʼelu egbugbere ọnụ ya na eze ya.
SOL 7:10 Abụ m nke onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa m ka ọ chọrọ.
SOL 7:11 Bịa, onye m hụrụ nʼanya, ka anyị gaa nʼime obodo, ka anyị nọọ ọnọdụ abalị nʼobodo nta.
SOL 7:12 Ka anyị bilie ngwangwa nʼisi ụtụtụ pụọ jee nʼubi lee ma osisi vaịnị ha amaala ifuru, ma okoko ya agbawaala, ma osisi pomegranet agbawaala okoko. Nʼebe ahụ ka m ga-egosi gị ịhụnanya m.
SOL 7:13 Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nụ isi nke mandreki na-ewepụta; mkpụrụ osisi niile na-atọ ụtọ ga-adịkwa nʼọnụ ụzọ anyị, ma ndị ọhụrụ ma ndị ochie, nʼihi na edokọtaala m ha maka onye m hụrụ nʼanya.
SOL 8:1 O, a sịkwarị na ị bụ nwanne m nwoke; nke otu nne mụrụ mụ na ya m gaara esutu gị ọnụ mgbe anyị zutere nʼokporoụzọ ma ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-eleda m anya.
SOL 8:2 Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m, ka ị nọdụ nʼebe ahụ, nʼụlọ onye ziri m ihe. Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ, mmanya ụtọ nke pomegranet.
SOL 8:3 Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m.
SOL 8:4 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta tupu ruo mgbe ọ masịrị ya.
SOL 8:5 Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa, onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya. Onye a hụrụ nʼanya Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị; nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị; nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị.
SOL 8:6 Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi, dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ, ekworo ya dịkwa ike dịka ala mmụọ. Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere, dịka ọkụ nke dị ukwu.
SOL 8:7 Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya, osimiri niile enwekwaghị ike iri ya. Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya, a ga-eleda ya anya nke ukwuu.
SOL 8:8 Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta ma ọ kpụbeghị ara. Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị, nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya?
SOL 8:9 Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi, anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ, anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya.
SOL 8:10 Abụ m mgbidi, ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu. Otu a ka m siri dị nʼanya ya dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju.
SOL 8:11 Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon, o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta. Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.
SOL 8:12 Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye. Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn, ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ.
SOL 8:13 Gị onye bi nʼubi a gbara ogige, gị na ndị enyi gị, kwere ka m nụ olu gị.
SOL 8:14 Soro m ka anyị pụọ, onye m hụrụ nʼanya, bịakwute m dịka mgbada, maọbụ dịka nwa ele na-awụgharị nʼelu ugwu ebe ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ jupụtara.
ISA 1:1 Ọhụ Aịzaya nwa Emọz, nke ọ hụrụ banyere Juda na Jerusalem nʼoge ọchịchị Ụzaya, Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda.
ISA 1:2 Gee ntị, gị eluigwe, gee ntị, gị ụwa! Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola okwu: “Azụrụ m ụmụntakịrị, zụlite ha, ma ha enupula isi megide m.
ISA 1:3 Ehi maara onyenwe ya, ịnyịnya ibu makwaara ebe onyenwe ya na-anọ azụ ya nri, ma Izrel amaghị m, ndị m adịghị aghọtakwa.”
ISA 1:4 Ahụhụ dịrị mba ndị mmehie, ndị ajọ omume riri ahụ, ụmụ ndị ajọ omume, ụmụ ndị nyefere onwe ha na mmerụ! Ha agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ha elelịala Onye dị Nsọ nke Izrel, ha agbakụtala ya azụ ha.
ISA 1:5 Gịnị mere a ga-eji nọgide na-eti unu ihe? Gịnị mere unu ji nọgide na nnupu isi? Lee ọnya juru unu isi, leekwa na ọrịa na-arịa obi unu.
ISA 1:6 O nweghị akụkụ ahụ unu zuruoke, site nʼọbọ ụkwụ unu ruo nʼopi isi unu; ọnya, na ntihịa ahụ, na ọnya mmerụ ahụ, jupụtara unu nʼahụ; e kechikwaghị ha, e tekwaghị ha mmanụ.
ISA 1:7 Ala unu tọgbọrọ nʼefu, agbaakwala obodo unu ọkụ. Ndị mbịarambịa ewerechaala ihe dị nʼubi unu nʼihu unu, ha emeela ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka mgbe onye ọbịa kpochapụrụ ihe dị nʼime ya.
ISA 1:8 Ada Zayọn ka a hapụrụ dịka ụlọ nche dị nʼubi vaịnị, dịka ụlọ nta dị nʼubi kukumba, dịka obodo ndị iro gbara gburugburu.
ISA 1:9 Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile emeghị ka mmadụ ole na ole fọdụ ndụ nʼime anyị, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.
ISA 1:10 Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-achị Sọdọm; geenụ ntị nʼozizi Chineke anyị, unu ndị Gọmọra.
ISA 1:11 “Nʼihi gịnị ka unu ji na-achụrụ m ọtụtụ aja, gịnị ka ihe ndị a bụ nye m?” ka Onyenwe anyị sịrị. “Afọ ejula m nʼaja nsure ọkụ niile nke eji ebule na anụmanụ e mere ka ha gbaa abụba chụọ; Ọbara oke ehi na nke ụmụ atụrụ na mkpi adịghị atọkwa m ụtọ.
ISA 1:12 Mgbe unu na-abịa ka ahụ unu nʼihu m, onye chọrọ nke a nʼaka unu? Kwụsịnụ ịzọtọ ogige m.
ISA 1:13 Kwụsị iweta onyinye niile na-enweghị isi. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ unu bụrụ m ihe arụ. Mmemme ọnwa ọhụrụ, na nke ụbọchị izuike, na nzukọta unu niile, apụghị m ịnagide mkpọkọta unu nke na-abaghị uru.
ISA 1:14 Mkpụrụobi m kpọrọ mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme unu ndị ọzọ a kara aka asị. Ha bụụrụ m ibu arọ, ike agwụkwala m ibu ha.
ISA 1:15 Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere, agaghị m aṅa unu ntị; ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, agaghị m aṅa ntị.” Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara!
ISA 1:16 Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha. Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m; kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma.
ISA 1:17 Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi, nyerenụ ndị a na-emegbu aka. Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ, ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ.
ISA 1:18 “Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe Onyenwe anyị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe, a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha.
ISA 1:19 Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a.
ISA 1:20 Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya.
ISA 1:21 Lee ka obodo ahụ kwesiri ntụkwasị obi aghọọla onye akwụna! Ọ bụ nke jupụtararị nʼikpe ziri ezi; ezi omume na-anọbu nʼime ya, ma ugbu a, ọ bụzi ndị ogbu mmadụ.
ISA 1:22 Ọlaọcha gị aghọọla unyi, ezi mmanya gị aghọọla nke a gwafere mmiri oke.
ISA 1:23 Ndị ndu gị niile bụ ndị nnupu isi, ndị bụkwa ndị enyi ndị ohi, onye ọbụla nʼime ha hụrụ iri ngarị nʼanya, na-agbasokwa onyinye. Ha adịghị echebe ndị na-enweghị nna ikpe gbasara ndị inyom di ha nwụrụ adịghị abịa nʼihu ha.
ISA 1:24 Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye dị ike nke Izrel, kwubiri sị, “Aga m abọ ọbọ megide ndị iro m, ime ka unu gharakwa inye m nsogbu ọzọ.
ISA 1:25 Aka m ga-abịakwasị unu. Aga m anụcha unu dịka e si anụcha ọlaedo, si otu a wepụchaa unyi niile dị nʼime unu.
ISA 1:26 Emesịa, aga m enye unu ndị na-ekpe ikpe ziri ezi. Ndị na-adụ unu ọdụ ga-abụkwa ndị nwere uche dịka ndị unu nwere na mbụ. Ọzọ, a ga-akpọ obodo unu Obodo Ezi Omume, Obodo kwesiri Ntụkwasị Obi.”
ISA 1:27 A ga-eji ikpe ziri ezi zọpụta Zayọn. Ọ ga-ejikwa ezi omume zọpụta ndị niile lọghachikwutere ya.
ISA 1:28 Ma ndị mmehie niile na ndị niile na-enupu isi ka ọ ga-ala nʼiyi; ọ ga-egbukwa ndị niile na-agbakụta Onyenwe anyị azụ.
ISA 1:29 “Ihere ga-eme unu nʼihi osisi ook nsọ ndị ahụ niile obi unu na-enwe aṅụrị nʼime ha. Ihere ga-eme unu nʼihi ubi a gbara ogige ndị ahụ unu jiri aka unu họrọ.
ISA 1:30 Unu ga-ala nʼiyi dịka osisi ook na-akpọnwụ akpọnwụ maọbụ ka ubi a gbara ogige nke mmiri kọrọ.
ISA 1:31 Onye kachasị ike nʼetiti unu ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa na-ere ọkụ; ọrụ ya ga-abụ icheku ọkụ nke ga-emenye ọkụ ahụ ga-erepịa unu. Ọ dịkwaghị onye pụrụ imenyụ ya.”
ISA 2:1 Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem.
ISA 2:2 Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi.
ISA 2:3 Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.
ISA 2:4 Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile, doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge; kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.
ISA 2:5 Unu ụlọ Jekọb, bịanụ ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị.
ISA 2:6 Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị, bụ ụlọ Jekọb azụ. Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ. Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia. Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka.
ISA 2:7 Ala ha jupụtara nʼọlaọcha na ọlaedo, ha bara ụba nke ukwuu. Ala ha jupụtara nʼịnyịnya. Ụgbọ agha ha dịkwa ukwuu.
ISA 2:8 Ala ha jupụtara nʼarụsị, ha na-akpọ isiala nye ihe ndị ahụ ha ji aka ha kpụọ, ihe ndị ahụ mkpịsịaka ha kpụrụ.
ISA 2:9 Nʼihi ya, a ga-eme ka mmadụ bụrụ ihe e wedara nʼala, meekwa ka mmadụ niile bụrụ ndị e wedara nʼala. Ya mere, agbagharala ha.
ISA 2:10 Gaanụ nʼime nkume, zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya.
ISA 2:11 Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala. Ọ bụ naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
ISA 2:12 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooro nye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu, nʼihi na ihe niile e buliri elu (ka a ga-eweda nʼala),
ISA 2:13 nye osisi sida niile topụrụ ogologo ma maa mma nke Lebanọn, na osisi ook niile nke Bashan,
ISA 2:14 nye ugwu ukwu niile nke dị elu, na ugwu nta niile e buliri elu,
ISA 2:15 nye ụlọ elu niile, na mgbidi niile e wusiri ike,
ISA 2:16 nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa, na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma.
ISA 2:17 Onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala. Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
ISA 2:18 A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa.
ISA 2:19 Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume, na nʼọnụ e gwuru nʼala, nʼihi egwu Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa.
ISA 2:20 Nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ, nke ha kpụrụ ma na-efe, hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.
ISA 2:21 Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume, na nʼime ọgba niile nke oke nkume nʼihi ịgbanarị iwe ọkụ Onyenwe anyị, na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe o biliri ịyọgharị ụwa.
ISA 2:22 Kwụsị ịtụkwasị mmadụ efu obi. O nweghị ihe ọ bụ karịa naanị nkuume ahụ dị ya nʼime, nʼihi gịnị ka e ji agụnye ya?
ISA 3:1 Nʼihi na, lee, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-akwado isite na Jerusalem na Juda wezuga ihe nnweta na ihe nkwado niile, ya na ihe oriri niile na mmiri ọṅụṅụ niile.
ISA 3:2 Ọ ga-ewezugakwa ndị bụ dike nʼetiti ha, na onye agha, na onye ikpe, na onye amụma, na onye na-ajụ ase, na ndị okenye ha,
ISA 3:3 na onyeisi agha na-achị ndị agha iri ise, na onye a na-asọpụrụ, na onye ndụmọdụ, na onye ọka maara ọrụ, na onye nwere ezi mmụọ nghọta ịkọ mmadụ ibe ya ọgwụ.
ISA 3:4 “Aga m eme ka ụmụ okorobịa ghọọ ndị ozi ha, meekwa ka ụmụ na-aṅụ ara bụrụ ndị ịchị isi dị nʼaka ha.”
ISA 3:5 Ndị mmadụ ga-emegbu ibe ha, otu onye megide onye ọzọ, onye agbataobi megide onye agbataobi ibe ya. Ụmụ okorobịa ga-ebili megide ndị okenye, ndị a na-elelị ga-emegide ndị a na-asọpụrụ.
ISA 3:6 Otu nwoke ga-ejide nwanne ya nwoke nʼụlọ nna ya sị ya, “I nwere akwa mgbochi, bụrụ onyendu anyị; lekọta mkpọmkpọ ebe a anya.”
ISA 3:7 Ma ọ ga-azaghachi nʼụbọchị ahụ sị, “O nweghị ihe m pụrụ ime. Enweghị m nri maọbụ akwa mgbochi nʼụlọ m. Emela m onyendu ndị a.”
ISA 3:8 Lee na Jerusalem na-asọ ngọngọ. Juda na-adakwa. Nʼihi na ndị bi nʼime ya ekwujọọla Onyenwe anyị. Ha na-elelịkwa, ma na-enupu isi nʼebube Onyenwe anyị.
ISA 3:9 Ihu ha na-egosi ihe ha bụ. Ọ na-ezipụta ajọ omume ha. Ha na-anya isi nʼime mmehie ha dịka Sọdọm. Ihere adịghịkwa eme ha. Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha ejirila aka ha kpatara onwe ha ahụhụ.
ISA 3:10 Zie ndị ezi omume niile ozi sị ha, na ihe ga-agara ha nke ọma, nʼihi na mkpụrụ sitere nʼomume ha niile ka ha ga-eri.
ISA 3:11 Ma gwa ndị na-emebi iwu na ahụhụ dịrị ha. Mbibi adakwasịla ha! Ha ga-eketa oke ruoru ha, nʼihi ihe aka ha kpataara ha.
ISA 3:12 Ụmụ okorobịa na-emegbu ndị m, ụmụ nwanyị na-achịkwa ha. Ndị m, lee na ndị na-achị unu na-eduhie unu ụzọ. Ha na-eme ka unu kpafuo; ha esitela nʼezi ụzọ wezuga unu.
ISA 3:13 Onyenwe anyị anyị ewerela ọnọdụ ya nʼụlọikpe; ọ na-eguzo ikpe ndị ya niile ikpe.
ISA 3:14 Onyenwe anyị na-aba nʼikpe megide ndị okenye na ndị ndu nke ndị ya niile. Ọ bụ unu bụ ndị lara ubi vaịnị m nʼiyi; ihe unu ji aka ike pụnara ndị ogbenye jupụtara nʼụlọ unu.
ISA 3:15 Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m, “Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?” Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
ISA 3:16 Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị, “Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako. Ha ji olu e setịrị eseti, na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị. Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu, na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda.
ISA 3:17 Nʼihi ya, Onyenwe anyị ga-eme ka ọnya jupụta nʼisi ndị inyom Zayọn, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ha gharakwa inwe agịrị isi nʼisi ha.”
ISA 3:18 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-anapụ ha ihe ịchọ mma ha niile, ma mgbaaka, ma ịchafọ ịgbado isi, ma ihe olu nke dị nʼụdịdị ọnwa ọhụrụ,
ISA 3:19 ma ọlantị, ma mgbaaka, ma akwa e ji ekpuchi ihu,
ISA 3:20 ma akwa ha na-eyi nʼisi, na ọla ụkwụ, ma ihe ha na-eke nʼukwu, ma karama mmanụ isi ụtọ, ma ọgwụ dị iche iche;
ISA 3:21 ma ọlaaka ha niile na ọla imi ha niile,
ISA 3:22 ma uwe mmemme ha niile ma uwe mwụda niile, ma akwa akwa mgbochi, ma akpa nta niile,
ISA 3:23 ma enyo ha niile, ma akwa ọcha niile, ma okpu ọma niile, ma mgbokwasị ha niile.
ISA 3:24 Nʼọnọdụ ụda ọma, ha ga-esi ure ure; nʼọnọdụ ihe ike nʼukwu, ha ga-ekekwasị onwe ha eriri; nʼọnọdụ agịrị isi e doziri edozi, ha agaghị enwe ọ bụladị otu agịrị isi; nʼọnọdụ akwa ọcha, ọ bụ akwa mkpe ka ha ga-eyi; nʼọnọdụ ịma mma, anụ ahụ ha ga-achakpọsị.
ISA 3:25 Ndị ikom unu ka a ga-eji mma agha gbuo, ndị bụ dike ka a ga-egbu nʼagha.
ISA 3:26 Ọnụ ụzọ ama niile nke Zayọn ga-eti mkpu akwa ruokwa ụjụ. Ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-anọdụ nʼala.
ISA 4:1 Nʼoge ahụ, ndị ikom ole na ole ga-afọdụ ndụ. Nke a ga-eme ka ndị inyom asaa na-azọ otu nwoke. Ha ga-abịakwute ya sị ya “Kwere ka anyị niile bụrụ ndị nwunye gị! Anyị ga-akpara onwe anyị nri, zụọra onwe anyị akwa. Naanị kwere ka anyị na-aza aha gị, ka a ghara ịkọ anyị ọnụ.”
ISA 4:2 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka Alaka Onyenwe anyị mabiga mma oke, ma nwekwa ebube dị ukwuu. Ndị fọdụrụ ndụ nʼIzrel ga-enweta ihe ubi ga-enye ha ọṅụ, na nke ga-ewetara ha obi nganga na mmụọ ịnya isi.
ISA 4:3 Ndị ahapụrụ na Zayọn, ndị nọ na Jerusalem ka a ga-akpọ ndị dị nsọ, bụ ndị ahụ niile e dere aha ha nʼetiti ndị bi nʼime Jerusalem.
ISA 4:4 Onyenwe anyị ga-asachapụ unyi niile nke ndị inyom Zayọn, ọ ga-asachapụkwa ọbara niile dị na Jerusalem site na mmụọ nke ikpe, na mmụọ nke ọkụ.
ISA 4:5 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-ewuru ugwu Zayọn niile na ndị niile zukọrọ nʼebe ahụ ndo ga-ekpuchi ha niile. Ihe ọ ga-eji mee ndo a bụ igwe ojii na anwụrụ ọkụ nke ga-adịrị ha nʼehihie, na ọkụ na-enwu enwu, nke ga-adịrị ha nʼabalị. Ebube ahụ ga-abụ ihe mkpuchi nye ha.
ISA 4:6 Ọ ga-abụrụ ha ebe mgbaba na ndo ime ka okpomọkụ nke ehihie hapụ ịchagbu ha. Ọ ga-abụkwara ha ebe izere ndụ, na ebe nzuzo pụọ nʼoke ifufe na mmiri.
ISA 5:1 Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya, abụ banyere ubi vaịnị ya. Onye m hụrụ nʼanya nwere ubi ya nʼelu ugwu nta nke bụ ezi ala.
ISA 5:2 O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya, werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya. O wuru ụlọ nche nʼetiti ya, sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya. Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi. Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị.
ISA 5:3 “Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere. Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m.
ISA 5:4 Olee ihe ọzọ m gaara emere ya karịa ihe m mere? Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ?
ISA 5:5 Ugbu a, lee, ihe m na-aga ime ubi vaịnị m a. Aga m ewepụ ihe mgbochi a gbara ya, hapụ ya ka ọ ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri. Aga m etida mgbidi ya hapụ ya ka ọ bụrụ ebe a na-azọtọ ụkwụ.
ISA 5:6 Agaghị m akwachakwa ya ọzọ. Agakwaghị m egwuru ya ala, aga m ahapụ ya ka ogwu na uke too nʼime ya. Aga m enyekwa igwe ojii iwu ka mmiri ghara izokwasị ya ọzọ.”
ISA 5:7 Ubi vaịnị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ mba Izrel na ndị Juda, ha bụ vaịnị ahụ nke nʼatọ obi ya ụtọ. Ma o lere anya ikpe ziri ezi, ma ihe ọ hụrụ bụ iwusi ọbara. O lere anya ezi omume, ma ihe ọ nụrụ bụ mkpu akwa ndị a na-emegbu emegbu.
ISA 5:8 Ahụhụ dịrị unu ndị na-azụkọta ala ma ndị ọzọ ahụghị ebe ha ga-ebi, unu ndị na-ewu ụlọ na-ewukwasị ụlọ nʼala buru ibu, ime ka ọ bụrụ naanị unu bi nʼụwa.
ISA 5:9 Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ihe banyere unu, na ọnọdụ unu. Eji m ntị m abụọ nụ mgbe ọ na-asị, “Nʼezie, ọtụtụ ụlọ mara mma ga-atọgbọrọ nʼefu, ụlọ ukwu mara mma ndị nwe ha agaghị anọkwa.
ISA 5:10 Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii, ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.”
ISA 5:11 Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ ịgbaso mmanya. Ndị na-amụgide anya abalị tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke.
ISA 5:12 Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une, na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu, ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya; unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya.
ISA 5:13 Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ, nʼihi amaghị ihe; ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ, ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri.
ISA 5:14 Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara, ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke; ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo, tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke.
ISA 5:15 Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu, na ndị dị ala, ndị mpako ka a ga-eweda nʼala.
ISA 5:16 Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya, Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya.
ISA 5:17 Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ, ehi na anụ ụlọ ga-akpa nri ha nʼụlọ ndị ọgaranya niile e tikpọrọ etikpọ.
ISA 5:18 Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha; ahụhụ dịkwara ndị na-adọkpụgharị ajọ omume ha dịka ụdọ eji adọkpụgharị ụgbọala.
ISA 5:19 Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa; ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ, ka anyị hụ ya. Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel, ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè, ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.”
ISA 5:20 Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ, ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu.
ISA 5:21 Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha, ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta.
ISA 5:22 Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya, na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya,
ISA 5:23 ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị, ma wezuga ikpe ziri ezi site nʼebe onye aka ya dị ọcha nọ.
ISA 5:24 Nʼihi ya, dịka ire ọkụ si erechapụ ahịhịa ọka, na dịka ahịhịa kpọrọ nkụ si ada nʼime ọkụ na-enwu enwu, otu a ka mgbọrọgwụ ha ga-ere ure okoko ha ka ikuku ga-ebufu dịka uzuzu; nʼihi na ha ajụla iwu niile Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nyere, lelịakwa okwu nke Onye nsọ Izrel.
ISA 5:25 Nʼihi nke a, iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide ndị ya; o setịpụrụ aka ya na-etitu ha nʼala. Ugwu niile ga-ama jijiji, ozu ndị ahụ dịka ihe na-abaghị uru nʼokporoụzọ niile. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
ISA 5:26 Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya, ọ na-akpọkọta ndị niile nọ na nsọtụ ụwa. Ma lee, ka ha na-abịa, ha na-eme ngwa bịa ọsịịsọ.
ISA 5:27 Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha, ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra, ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi.
ISA 5:28 Àkụ ha niile dị nkọ, ekweela ụta ha niile, ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ, ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe.
ISA 5:29 Ha na-ebigbọ dịka ọdụm, ha na-ebigbọkwa dịka ụmụ ọdụm; ha na-asụ mgbe ha wụkwasịrị nʼelu ihe ndọgbu. Ha na-ejide ndị m, kpụrụ ha laa, ọ dịkwaghị onye nnapụta ha nwere.
ISA 5:30 Nʼụbọchị ahụ, ha ga-ebigbọ nʼelu ya dịka mbigbọ nke oke osimiri. A sịkwa na mmadụ elegide ala ahụ anya, ọ ga-ahụ na ọchịchịrị na ihe mgbu, ọ bụladị anyanwụ ka igwe ojii ga-eme ka ọ gbaa ọchịchịrị.
ISA 6:1 Nʼafọ ahụ, mgbe eze bụ Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọ nʼocheeze ya dị oke elu. Ọnụ ọnụ ala uwe ya jupụtara ụlọnsọ ukwuu ya.
ISA 6:2 Ndị na-erugharị nʼelu ocheeze ya bụ ndị mmụọ ozi a na-akpọ seraf, ndị nwere nku isii. Ha ji nku ha abụọ kpuchie ihu ha; abụọ ka ha ji kpuchie ụkwụ ha, abụọ nke fọdụrụ ka ha ji na-efegharị.
ISA 6:3 Ha na-abụrịtara onwe ha abụ, sị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile dị. Ụwa niile jupụtara nʼebube ya.”
ISA 6:4 Nʼihi ụda olu ha, ọnụ ụzọ na mgbidi ụlọnsọ mara jijiji, ụlọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ.
ISA 6:5 Etiri m mkpu akwa sị. “Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ, nʼihi na onye mmehie ka m bụ, egbugbere ọnụ m bụ egbugbere ọnụ rụrụ arụ; ọ bụkwa nʼetiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m bi. Ugbu a, ejirila m anya m hụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Eze ukwu ahụ!”
ISA 6:6 Mgbe ahụ, otu nʼime seraf ndị ahụ sitere nʼebe ọ nọ fekwute m, were mkpa gụta otu icheku dị ọkụ site nʼebe ịchụ aja.
ISA 6:7 O weere icheku ọkụ ahụ sọtụ m nʼọnụ, sị m, “Ugbu a, a gụọla gị dịka onye dị ọcha, nʼihi na icheku a emetụla gị nʼọnụ. A gbagharakwala gị mmehie gị niile.”
ISA 6:8 Mgbe ahụ, anụrụ m olu Onyenwe anyị ka ọ na-ajụ, “Onye ka m ga-eziga? Onye ga-ejekwara anyị?” Asịrị m, “Lee m, ziga m.”
ISA 6:9 Ọ siri, “Gaa gwa ndị a sị, “ ‘Na-anụnụ, ma unu aghọtala, na-elenụ anya ma unu ahụla.’
ISA 6:10 Mee ka obi ndị a maa abụba, dịkwa arọ, mee ka ntị ha kpọchie, mechiekwa anya ha. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jiri ntị ha nụ ihe, jirikwa obi ha ghọta, ma chigharịa bụrụ ndị a gwọrọ.”
ISA 6:11 Ma ekwuru m sị, “Onyenwe m, ọ bụ ruo ole mgbe?” Ọ zara, “Ọ bụ ruo mgbe obodo ha tọgbọrọ nʼefu, mgbe ọ na-adịghị onye ga-afọdụ nʼime ya; mgbe ụlọ obibi ha niile ga-atọgbọrọ nʼefu, mgbe e bibisịrị ala ubi ha niile.
ISA 6:12 Ọ bụ ruo mgbe Onyenwe anyị zigara onye ọbụla gaa ebe dị anya, ala niile atọgbọkwara nʼefu.
ISA 6:13 Ma ọ bụrụkwa na otu ụzọ nʼime ụzọ iri nʼime ha niile afọdụ nʼala a, a ga-eme ka ọ laa nʼiyi. Ma dịka osisi terebint na osisi ook na-ahapụ ogwe mgbe e gbujiri ha, ya mere mkpụrụ nsọ ahụ ga-abụ ogwe osisi nʼala ahụ.”
ISA 7:1 Mgbe Ehaz, nwa Jotam, nwa nwa Ụzaya bụ eze na Juda, Rezin eze Aram, na Peka eze Izrel, nwa Remalaya, busoro Jerusalem agha. Ma ha emerighị ya; obodo ahụ guzosiri ike.
ISA 7:2 Ma mgbe e mesịrị, ozi ruru ụlọ Devid ntị sị, “Ndị Aram na Ifrem ejikọọla onwe ha ọnụ”; nke a mere ka ụlọeze, na obi ndị ọ na-achị maa jijiji, dịka osisi dị nʼọhịa si ama jijiji mgbe oke ifufe na-efe.
ISA 7:3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Aịzaya okwu sị ya, “Jekwuru Ehaz bụ eze. Mgbe ị na-aga, kpọrọ Shịa-Jashub nwa gị nwoke. Unu ga-ahụ Ehaz nʼakụkụ Elu elu olulu ọdọ mmiri nke dị nʼụzọ ahụ gawara nʼAla ọsụ akwa.
ISA 7:4 Gwa ya ka ọ ghara inye ndụ ya nsogbu, ka ọ gharakwa ịtụ egwu. Sị ya, ‘Lezie anya, nọ jụụ, echegbula onwe ya banyere icheku ọkụ abụọ ahụ na-anyụ anyụ. Atụla egwu nʼihi iwe Rezin nwa Aram, na iwe Peka nwa Remalaya.
ISA 7:5 E, Aram, na Ifrem, na nwa nwoke Remalaya, agbaala izu ibuso gị agha ịla gị nʼiyi. Ha ekwuola sị,
ISA 7:6 “Ka anyị wakpo Juda, ka anyị dọwaa ya ma kee ya nʼetiti onwe anyị, mee nwa Tabeel ka ọ bụrụ eze ya.”
ISA 7:7 Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Ọ gaghị adị ire! Ọ gaghị emezukwa.
ISA 7:8 Nʼihi isi obodo Aram bụ Damaskọs. Onyeisi Damaskọs bụ naanị Rezin. Ma tupu afọ iri isii na ise agafee a ga-etikpọkwa Ifrem.
ISA 7:9 Isi obodo Ifrem bụ Sameria. Onyeisi Sameria bụ naanị nwa Remalaya. Ọ bụrụ na unu eguzosighị ike nʼokwukwe unu, unu agaghị eguzo ma ọlị.’ ”
ISA 7:10 Ọ dịghị anya, Onyenwe anyị ziri Ehaz ozi ndị a sị,
ISA 7:11 “Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.”
ISA 7:12 Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa Onyenwe anyị m otu a.”
ISA 7:13 Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya?
ISA 7:14 Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị.
ISA 7:15 Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka nwantakịrị ahụ ga-eri mgbe ọ matara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ezi ihe.
ISA 7:16 Tupu a zụlite nwantakịrị ahụ ịmata ịhọrọ ezi ihe na ịjụ ajọ ihe, ndị eze abụọ ndị ị na-atụ egwu ha, ga-anwụcha.
ISA 7:17 Onyenwe anyị ga-eme ka ọbụbụ ọnụ dị ukwuu bịakwasị gị na obodo gị, na ezinaụlọ gị. Ihe egwu ga-adịkwa, ụdị nke a na-ahụbeghị mbụ, site nʼoge e kewapụrụ Ifrem site na Juda. Eze Asịrịa ga-edu ndị agha ya bịa.”
ISA 7:18 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-akpọku ijiji site na nsọtụ Naịl dị nʼIjipt nakwa aṅụ sitere nʼala Asịrịa.
ISA 7:19 Ha ga-abịa nʼigwe, bichie ndagwurugwu ala gị niile, na nʼọgba nkume niile, na nʼọhịa ogwu ogwu niile, na nʼọzara niile, na nʼezi ala niile.
ISA 7:20 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji agụba e gotara nʼofe osimiri, nke bụ eze Asịrịa, kpụchapụ unu agịrị isi na ajị ụkwụ, kpụchapụkwa afụọnụ unu niile.
ISA 7:21 Nʼụbọchị ahụ, otu onye ga-edebe otu nwa ehi na ewu abụọ ndụ.
ISA 7:22 Onye ọbụla kwa nʼala ahụ ga-eri mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, ya na mmanụ aṅụ, nʼihi na mmiri ara ehi ga-aba ụba nke ukwuu nʼala ahụ.
ISA 7:23 Nʼụbọchị ahụ, ala ọbụla nke nwere otu puku osisi vaịnị nke ọnụahịa ya ruru otu puku shekel ọlaọcha ga-abụ naanị ogwu na uke.
ISA 7:24 Ndị dinta ga-achịrị àkụ na ùta gaa nʼebe ahụ, nʼihi na uke na ogwu ga-ekpuchi ala ahụ.
ISA 7:25 Ma banyere ugwu eji ọgụ kọọ na mbụ, ị gaghị abakwa nʼebe ahụ ọzọ nʼihi egwu uke na ogwu; ha ga-abụ ebe a na-atọpụ ehi na ebe atụrụ na-agbagharị.
ISA 8:1 Onyenwe anyị siri m, “Were otu mbadamba ihe dị ukwuu, were odee nke onye ọbụla na-eji ede ihe dekwasị ya Maha-shalal-Hash-Baz.
ISA 8:2 Aga m akpọbata Ụraya onye nchụaja na Zekaraya nwa Jeberekaya dịka ndị akaebe kwesiri ntụkwasị obi.”
ISA 8:3 Emesịa, mụ na nwunye m, bụ onye amụma dinakọrọ, ọ tụụrụ ime, mụọrọ m nwa nwoke. Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gụọ ya Maha-shalal-Hash-Baz.
ISA 8:4 Nʼihi na tupu nwantakịrị ahụ etolite ịkpọ nne maọbụ nna, eze ndị Asịrịa ga-ebuso Damaskọs na Sameria agha, bukọrọkwa akụ ha niile.”
ISA 8:5 Onyenwe anyị gwakwara m okwu ọzọ sị,
ISA 8:6 “Nʼihi na ndị a ajụla mmiri Shiloa nke ji nwayọọ na-asọ ma na-aṅụrị ọṅụ nʼihi Rezin na nwa nwoke Remalaya,
ISA 8:7 ya mere, Onyenwe anyị na-aga iweta iju mmiri nke osimiri Yufretis megide ha, bụ eze ndị Asịrịa ya na ebube ya niile. Ọ ga-erubiga oke, gafee ụzọ ya niile, ọ ga-erubiga ma tofeekwa ọnụ ya niile,
ISA 8:8 wụsịakwa nʼala Juda niile. Ọ ga-erikpu ala Juda niile, ọ ga-agabiga, kpuchiekwa ọ bụladị nʼolu ka ọ ga-eru. Nku ya ga-agbasa kpuchie obosara niile nke ala gị, O Ịmanụel.”
ISA 8:9 Tienụ mkpu agha unu mba dị iche iche, ma a ga-etipịa unu. Geenụ ntị unu mba niile dị ebe dị anya. Kwadoonụ maka agha ma a ga-etipịa unu. Kwadoonụ maka agha ka e tipịa unu.
ISA 8:10 Tụọnụ atụmatụ unu ma a ga-ekposa ya. Wepụtanụ atụmatụ unu ma ọ gaghị eguzo nʼihi na Chineke nọnyere anyị.
ISA 8:11 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị m nʼike nke aka ya dị nʼahụ, ọ dọrọ m aka na ntị ka m ghara ije ije nʼụzọ ndị nke a, na-asị:
ISA 8:12 “Adịnyerela ha nʼihe niile ha na-ezube ime na nzuzo megide ọchịchị; ka ihe ha na-atụ egwu hapụ ịbụ ihe ga-eme ka ị tụọ egwu.
ISA 8:13 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ya ka unu ga-edo nsọ. Ya bụ onye unu kwesiri ịtụ ụjọ. Ya bụ onye unu ga-atụ egwu ma jijiji.
ISA 8:14 Ọ ga-abụkwa ebe nsọ; nye ụlọ Izrel na Juda, ọ ga-aghọrọ ha nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem igbudu na ọnya nke ha ga-adaba nʼime ya.
ISA 8:15 Ọtụtụ nʼime ha ga-asọ ngọngọ; ha ga-ada bụrụ ndị e tipịara. Ha ga-abụ ndị ọnya ga-ama, na ndị a ga-anwude.”
ISA 8:16 Kechie ihe ịgba ama nke iwu a kpuchie ntụziaka Chineke nke ọma nʼetiti ndị na-eso ụzọ ya.
ISA 8:17 Aga m echere Onyenwe anyị, onye na-ezonarị ụlọ Jekọb ihu ya ugbu a. Aga m atụkwasị obi m na ya.
ISA 8:18 Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Onyenwe anyị nyere m. Anyị bụ ihe ịrịbama na ihe iji cheta ihe nye ndị Izrel site na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-ebi nʼugwu Zayọn.
ISA 8:19 Mgbe onye ọbụla sịrị unu, jụtanụ ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa ihe, bụ ndị na-ekwu okwu nʼolu dị nta nke mmadụ na-adịghị anụ nke ọma na ndị na-atamu atamu, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ Chineke ha ase? Ọ bụ nʼihi gịnị ka eji jụta ndị nwụrụ anwụ ase nʼihi ndị dị ndụ?
ISA 8:20 Lezienụ okwu ntụziaka na nke ịdọ aka na ntị Chineke anya. Ọ bụrụ na ozi ha dị iche na nke a, o gosiri na ha enweghị ìhè maọbụ eziokwu ọbụla nʼime ha.
ISA 8:21 Ndị a ga-awagharị nʼala a niile. Agụụ ga-agụ ha, ha ga-adakwa mba. Nʼọnọdụ oke agụụ nke ga-agụ ha, iwe dị ukwuu ga-ewe ha, mee ka ha lelie anya ha nʼelu, kọchaa eze ha, na Chineke ha.
ISA 8:22 Mgbe ahụ, ọ bụrụ na ha eledata anya ha nʼala ọ bụ naanị oke nsogbu na oke ihe mgbu ka ha ga-ahụ. Ha ga-ahụkwa oke ihe egwu na ọchịchịrị. Ụzọ mgbapụ agaghị adịkwara ha nʼoge nsogbu a. A ga-achụbanye ha nʼime ọchịchịrị.
ISA 9:1 Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan.
ISA 9:2 Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu; ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.
ISA 9:3 I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu, mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu, ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị, dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi, dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.
ISA 9:4 Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia, i gbajisiela ibu arọ niile e bokwasịrị ha, ihe mgbochi nke dị nʼubu ha, nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha.
ISA 9:5 Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi, na uwe agha nke ọbara mechuru, ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ, ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma.
ISA 9:6 Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.
ISA 9:7 Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị, chịakwa nʼalaeze ya. Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike; ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezukwa nke a.
ISA 9:8 Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọb ọ ga-adakwasịkwa Izrel.
ISA 9:9 Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya, Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwa bụ ndị na-eji nganga na mpako na-ekwu sị,
ISA 9:10 “Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha; ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị, ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.”
ISA 9:11 Ma Onyenwe anyị a kpaliela ndị iro Rezin ka ha bilie megide ha, ọ kwaliekwala ndị iro ha.
ISA 9:12 Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
ISA 9:13 Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a, ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya.
ISA 9:14 Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ, ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile.
ISA 9:15 Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha, ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha.
ISA 9:16 Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha; ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo.
ISA 9:17 Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ, ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ, nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume, ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
ISA 9:18 Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ: ọ na-erepịa ogwu na uke, ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ, mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe.
ISA 9:19 Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe, ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere; ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya; ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya.
ISA 9:20 Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe, onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri. Ha ga-eri ma afọ agaghị eju ha; nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha.
ISA 9:21 Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ. Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ. Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
ISA 10:1 Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi; ndị niile na-atụpụta iwu mmegbu,
ISA 10:2 iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha nakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi, na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri ha na izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere.
ISA 10:3 Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?
ISA 10:4 Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ, maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
ISA 10:5 “Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m. Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma m dị.
ISA 10:6 Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke, m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe, ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike, nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ.
ISA 10:7 Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere, nke a abụghị ihe ọ na-eche nʼobi ya; o zubere ịla ndị m nʼiyi, na ibibi ọtụtụ mba dị iche iche.
ISA 10:8 Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’
ISA 10:9 ‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish? Hamat ọ dịghị ka Apad; Sameria ọ dịghịkwa ka Damaskọs?
ISA 10:10 Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị, alaeze dị iche iche nke arụsị apịrị apị ha karịrị nke Jerusalem na Sameria.
ISA 10:11 Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị dịka m mere Sameria na arụsị ya niile?’ ”
ISA 10:12 Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya.
ISA 10:13 Nʼihi na ọ na-asị, “ ‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a, ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta. Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche, apụnara m ha akụ ha niile; dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m.
ISA 10:14 Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ, otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche, dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ, otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile; Ọ dịghị onye megharịrị otu nku, maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’ ”
ISA 10:15 Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ, ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe? Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu, maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi.
ISA 10:16 Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti; ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya dịka ire ọkụ nke na-ere ere.
ISA 10:17 Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ, Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi. Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ ogwu niile na uke niile ọkụ.
ISA 10:18 A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ nʼiyi kpamkpam, dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi.
ISA 10:19 Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ, ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ.
ISA 10:20 Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel, na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb, agaghịkwa adabere nʼonye ahụ tidara ha, kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel.
ISA 10:21 Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu.
ISA 10:22 Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-alọghachi. A kabiela ịla nʼiyi, nke dị oke ukwuu ya na ezi omume.
ISA 10:23 E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela na ọ ga-ebibi ala ahụ niile.
ISA 10:24 Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị, “Unu ndị m, ndị bi na Zayọn, unu atụkwala ndị Asịrịa egwu bụ ndị na-eti unu mkpara igwe, na-ewelikwa mkpọ megide unu dịka ndị Ijipt mere.
ISA 10:25 Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ, ma ọ ga-ebili megide ha, laakwa ha nʼiyi.”
ISA 10:26 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihe dịka o sịrị tie ndị Midia ihe na nkume Oreb. Ọ ga-eweli mkpanaka ya nʼelu oke osimiri, ọ ga-eweli ya dịka o mere nʼIjipt.
ISA 10:27 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị Asịrịa nọ. Ụdọ igwe ha kenyere unu nʼolu ka m ga-adọbisi, wezuga ibu arọ unu.
ISA 10:28 Ha erutela Ayịat; ugbu a, ha nọ na Migrọn. Ha na-edokọta ngwa agha ha na Mikmash.
ISA 10:29 Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara; ha ekpebiela ịnọ ọnọdụ abalị na Geba! Ndị Rema na-ama jijiji, obodo Gibea nke bụ obodo Sọl agbapụla ọsọ ndụ.
ISA 10:30 Tienụ mkpu akwa unu ada Galim, geenụ ntị unu ndị Laisha! Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot!
ISA 10:31 Lee na Madmena nọ nʼọsọ, ndị Gebim na-ezo onwe ha.
ISA 10:32 Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa; ha na-atụ ugwu Zayọn na Jerusalem aka, na-ekwere ya nʼisi.
ISA 10:33 Lee Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji oke ike gbutuo ngalaba osisi niile. Ọ ga-egbutukwa osisi ndị dị elu, meekwa ka ndị toro ogologo dị ala.
ISA 10:34 Ya onwe ya ga-egbutu ha niile ka e si eji anyụike egbutu osisi dị nʼoke ọhịa. Lebanọn ga-adakwa nʼihu Onye ahụ dị ike dịka osisi dị nʼoke ọhịa si ada.
ISA 11:1 Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi; otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ.
ISA 11:2 Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya, inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta, Mmụọ ndụmọdụ na ike, Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị.
ISA 11:3 Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị. Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ, maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya.
ISA 11:4 Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe; ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa. Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ, ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ.
ISA 11:5 Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume, ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya.
ISA 11:6 Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo; agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa. Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa, ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha.
ISA 11:7 Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe, ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe. Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi.
ISA 11:8 Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala; nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi.
ISA 11:9 Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe, nʼelu ugwu nsọ m niile. Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
ISA 11:10 Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube.
ISA 11:11 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt, sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu.
ISA 11:12 Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ, ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha.
ISA 11:13 Ekworo Ifrem ga-akwụsị, a ga-ebipụ ndị iro Juda. Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị; ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ.
ISA 11:14 Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha; ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha. Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab. Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi.
ISA 11:15 Onyenwe anyị ga-eme ka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa. Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụ mikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis. Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa, nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee.
ISA 11:16 Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọ nʼihi ndị ya fọdụrụ nʼebe ahụ, dịka o si meere ndị Izrel nʼoge gara aga, mgbe ha si nʼIjipt na-alọta.
ISA 12:1 Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị, “Aga m eto gị Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe, ma ugbu a, iwe gị adajụọla; ị kasịkwara m obi.
ISA 12:2 Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”
ISA 12:3 Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.
ISA 12:4 Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.
ISA 12:5 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.
ISA 12:6 Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”
ISA 13:1 Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ.
ISA 13:2 Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu. Kpọkuonụ ndị agha. Feerenụ ha aka, ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi.
ISA 13:3 Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu; akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m. E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m.
ISA 13:4 Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile; gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme. Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche. Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe. Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha.
ISA 13:5 Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya na nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa. Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyị na-abịa imebi ala ahụ niile.
ISA 13:6 Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu.
ISA 13:7 Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba, obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri.
ISA 13:8 Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu. Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme. Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme. Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha.
ISA 13:9 Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa, ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma. A ga-ekpochapụ ala ahụ, ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya.
ISA 13:10 Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu agaghị egosipụta ìhè ha. Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.
ISA 13:11 Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya, taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa, ya na nganga onye na-adịghị eme ebere.
ISA 13:12 Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha, ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa.
ISA 13:13 Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji, meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya, nʼihi oke iwe ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.
ISA 13:14 Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ. Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka ha dịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta, maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha.
ISA 13:15 Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ, onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo.
ISA 13:16 A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha; a ga-anapụ ha ụlọ ha, merụkwaa ndị nwunye ha.
ISA 13:17 Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha; ọ dịkwaghị ọlaedo maọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya.
ISA 13:18 Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa; ha agaghị emekwara ụmụntakịrị ebere, maọbụ gosi ụmụ na-etopụta etopụta obi ebere.
ISA 13:19 Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile, ịma mma na ebube ndị Kaldịa, mgbe Chineke ga-akwatu ya ọ ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra.
ISA 13:20 Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Site nʼotu ọgbọ ruo nʼọgbọ ọzọ ndị mmadụ agaghị ebi nʼime ya. Ọ dịghị onye Arebịa na-ejegharị ejegharị ga-ama ụlọ ikwu ya nʼime ya; ndị ọzụzụ atụrụ agaghị ekwe ka atụrụ ha makpuru nʼebe ahụ.
ISA 13:21 Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara. Ụlọ dị nʼebe ahụ ga-abụkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa, na ikwighịkwighị, nʼebe ahụ kwa ka ụmụ mkpi ọhịa ga na-awụgharị.
ISA 13:22 A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike. Nkịta ọhịa ga-ebikwa nʼime ụlọ ọma niile dị nʼebe ahụ. Lee na oge ha ji emezu adịla nso, a gaghị emekwa ka oge imezu ihe ndị a dị anya.
ISA 14:1 Ma Onyenwe anyị ga-emekwara Jekọb ebere; ọ ga-ahọpụtakwa ndị Izrel ọzọ, meekwa ka ha lọghachi bịa biri nʼala nke aka ha. Ọtụtụ ndị ọbịa dị iche iche ga-adịnyere ha, soro ezinaụlọ Jekọb bikọtaa ọnụ.
ISA 14:2 Mba dị iche iche ga-enyere ha aka ịlọghachi nʼala ha, nke Onyenwe anyị nyere ha. Mba ndị a ga-aghọkwa ndị dị nʼokpuru ụmụ Izrel, ghọọkwara ha ndị ohu nwoke na nwanyị. Ụmụ Izrel ga-adọtakwa nʼagha ndị ahụ dọtara ha nʼagha na mbụ, ma chịakwa ndị ahụ kpagburu ha nʼoge gara aga.
ISA 14:3 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ị pụọ site nʼihe mgbu na ihe mwute, sitekwa na ndọgbu onwe unu nʼọrụ nke ịbụ ohu unu wetaara onwe unu,
ISA 14:4 unu ga-achị eze Babilọn ọchị sị ya, Leenụ gị. Ahaa, lee ka i si daa gị onye na-emegbu ndị mmadụ. Lee ka ịkpa ike gị si gwụsịa!
ISA 14:5 Nʼihi na Onyenwe anyị anyajiela mkpara ndị na-eme ajọ ihe, meekwa ka mkpara ndị na-achị achị,
ISA 14:6 nke sitere nʼiwe tidasịa ndị mmadụ na-esepụghị aka nʼiti ha ihe, nke ji nrubiga oke nke iwe ya megbuo mba dị iche iche ya na oke mmekpa ahụ na-enweghị nkwusi.
ISA 14:7 Ụwa niile adaala jụ, ha enwekwaala izuike, ha na-etipụ olu ịbụ abụ.
ISA 14:8 Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọn na-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị, “Agbajiela ike gị; ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.”
ISA 14:9 Ala mmụọ na-eme mkpọtụ, na-eche izute gị nʼọbịbịa gị; ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị, bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa, ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile bilie bụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche.
ISA 14:10 Ha niile ga-eji otu olu zaa, ha ga-asị gị, “Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike; Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.”
ISA 14:11 Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị, ka a na-elikọta nʼaja. Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina; ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị.
ISA 14:12 Lee ka i si site nʼeluigwe daa, gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ. Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ, ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala.
ISA 14:13 Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị, “Aga m arịgoro nʼeluigwe, doo ocheeze m nʼelu kpakpando niile Chineke kere; aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ, na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu.
ISA 14:14 Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe, mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.”
ISA 14:15 Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ.
ISA 14:16 Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya, na-atule banyere ndụ gị, sị, “Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji, onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ.
ISA 14:17 Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara? Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile, jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?”
ISA 14:18 Ndị eze mba niile dị iche iche na-edina na nsọpụrụ nʼime ili ha.
ISA 14:19 Ma ozu gị ka a tụpụrụ dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji. Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha, na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ, ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị. E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ.
ISA 14:20 A gaghị eli gị dịka e si lie ndị eze ndị ọzọ, nʼihi na i bibiela ala gị. I gbukwaala ndị gị. A gaghị akpọtụkwa aha ụmụ ụmụ ndị na-emebi iwu ọzọ.
ISA 14:21 Dozienụ ebe a ga-anọ gbuo ụmụ ya ndị ikom, nʼihi mmehie nke ndị bụ nna ha. Ha agaghị ebili nweta ala ahụ, mee ka elu ụwa jupụta nʼobodo ha niile.
ISA 14:22 Nʼihi na mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara sị, “Aga m ebili megide ha; aga m esitekwa na Babilọn bipụ aha ndị fọdụrụ, na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
ISA 14:23 Aga m eme ka Babilọn ghọọ ụlọ obibi nye ikwighịkwighị, na ebe mmiri ga na-adọkọ. M ga-eji azịza ịla nʼiyi zachapụ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
ISA 14:24 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aṅụọla iyi kwuo sị, “Nʼezie, dịka m si tụọ ya nʼobi m, otu a ka ọ ga-emekwa. Ọ ga-eguzosikwa ike dịka m si zube ya.
ISA 14:25 M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m, nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ. A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m, a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.”
ISA 14:26 Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere maka ụwa niile; nke a bụkwa aka ahụ esetipụrụ nʼelu mba niile dị iche iche.
ISA 14:27 Nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ dike nʼagha, ezubela ime ya. Onye kwa pụrụ ịgbanwe nzube ya? O setịpụla aka ya, onye pụrụ ime ka o weghachi ya azụ?
ISA 14:28 Amụma a bịara nʼafọ ahụ eze Ehaz nwụrụ:
ISA 14:29 Unu aṅụrịla ọṅụ, unu ndị Filistia, maka na mkpọrọ e ji eti unu ihe agbajiela; Ọ bụ ezie na ọ gbajiela, ma ihe ga-esite nʼọdụdụ agwọ ahụ pụta bụ ajụala, mkpụrụ ya ga-abụ agwọ ọjọọ, nke na-amagharị ebe niile.
ISA 14:30 Ndị bụ nnọọ ogbenye ga-achọta ihe oriri, ndị mkpa na-akpa ga-ebikwa nʼudo. Ma aga m eji agụụ na ụnwụ laa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti unu nʼiyi.
ISA 14:31 Kwasie akwa ike gị ọnụ ụzọ ama! Tie mkpu gị obodo! Tụọnụ oke egwu unu ndị Filistia. Nʼihi na lee, ndị agha a zụziri azụzi si nʼugwu na-abịa imegide gị. Ọ dịghị onye na-aga iche nʼetiti ahịrị ha.
ISA 14:32 Ọsịsa dị aṅaa ka anyị ga-enye ndị ozi si na mba ahụ? Gwa ha na Onyenwe anyị emeela ka Zayọn guzosie ike. Ọ bụkwa nʼime ya ka ndị ya e wedara nʼala ga-achọtara onwe ha ebe mgbaba.
ISA 15:1 Amụma megide Moab: Ar dị na Moab a laala nʼiyi, a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị. Kia dị na Moab a laala nʼiyi, a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.
ISA 15:2 Ndị niile bi na Dibọn na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba. Isi ha niile bụ isi nkwọcha, afụọnụ ha niile ka akpụchakwara.
ISA 15:3 Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi, mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama. Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa na-ada nʼala.
ISA 15:4 Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa, a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz. Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa, mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji.
ISA 15:5 Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab, ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa na Eglat Shelishiya. Ha na-akwa akwa dịka ha na-arịgo Luhit. Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim, ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha.
ISA 15:6 Mmiri Nimrim atachaala! Ahịhịa akpọnwụọkwala; ahịhịa ndụ niile agwụkwala o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ.
ISA 15:7 Ya mere akụnụba ha kpakọbara ndị ha chekwara ka ha buuru gafee ofe ndagwurugwu warawara nke ọdọ mmiri osisi pọpla niile.
ISA 15:8 Mkpu akwa ha na-ada ụda gburugburu oke ala Moab niile; akwa ha na-ebesi ike na-ada ruo obodo Eglaim; abụ akwa ha na-erukwa Bịa-Elim.
ISA 15:9 Iyi Dibọn jupụtara nʼọbara, ma aga m atụkwasịkwa ọ bụladị ọtụtụ ihe ndị ọzọ nʼelu Dibọn! Ọdụm ka a ga-atụkwasịrị ndị Moab gbapụrụ tụkwasịkwara ndị fọdụrụ nʼala ahụ.
ISA 16:1 Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye nye onye na-achị ala ahụ site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara ruo ugwu nke Ada Zayọn.
ISA 16:2 Ndị inyom Moab nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn na-akwụgharị dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ.
ISA 16:3 Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,” “Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri. Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị nʼetiti oke ehihie. Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ, ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe.
ISA 16:4 Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu, ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.” Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ, mbibi ga-akwụsịkwa, onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.
ISA 16:5 A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya; otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi, otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid, bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi, na-emekwa ngwa ime ezi omume.
ISA 16:6 Anyị anụla akụkọ banyere Moab, nụkwa ihe banyere nganga ya na aghụghọ ya niile. Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi? Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.
ISA 16:7 Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa, ha na-ebetara Moab akwa. Kwasie akwa ike, nwee mwute, nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset.
ISA 16:8 Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu; osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala. E, ndị eze mba dị iche iche azọdala ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ. E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza, ruokwa nʼọzara, nke mgbọrọgwụ ha gbasara ruo nʼọnụ osimiri.
ISA 16:9 Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza si akwa akwa nʼihi ubi vaịnị Sibma. Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ gị Heshbọn, na gị Eleale, nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.
ISA 16:10 Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma, ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige; ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya; nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị.
ISA 16:11 Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara, ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres.
ISA 16:12 Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu, ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya, mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya, o nweghị uru nke a ga-abara ha.
ISA 16:13 Ihe ndị a niile bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Moab na mbụ,
ISA 16:14 ma ugbu a Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụ si agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile Moab nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.”
ISA 17:1 Nke a bụ amụma megide Damaskọs, isi obodo Siria. “Lee, Damaskọs agaghị adịkwa! Ọ gaghị abụkwa obodo ọzọ, kama ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke zedara ezeda.
ISA 17:2 Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime nʼobodo niile nke Aroea, ọ ga-adịrị igwe atụrụ na ehi dị iche iche, ndị ga-amakpu, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka egwu tụọ ha nʼebe ahụ.
ISA 17:3 Ebe e wusiri ike nke Ifrem agaghị adịkwa, ya na ike alaeze nke sị Damaskọs, ndị fọdụrụ nke Aram ga-adị ka ebube nke ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
ISA 17:4 “Nʼụbọchị ahụ, a ga-eme ka nsọpụrụ Jekọb nwere bụrụ ihe e wedara nʼala. Abụba dịkwa ya nʼahụ ga-atalata.
ISA 17:5 Ọ ga-adị ka ubi e si nʼime ya wee ihe mkpụrụ site nʼọka guzoro ọtọ, na-achịkọta mkpụrụ nʼogwe aka ha dịka mgbe mmadụ na-atụtụkọta mkpụrụ site nʼigbo ọka nʼime Ndagwurugwu Refaim.
ISA 17:6 Ma ọ bụ ole na ole nʼime mkpụrụ ahụ ga-afọdụkwa, dịka mgbe a kuchasịrị osisi oliv, hapụ mkpụrụ abụọ maọbụ atọ, nke dị nʼalaka kachasị elu, maọbụ mkpụrụ anọ maọbụ ise a hapụrụ nʼọnụ ọnụ alaka nke ahụ mịrị mkpụrụ.” Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwubiri ya.
ISA 17:7 Nʼụbọchị ahụ, ha ga-echeta onye kere ha, nweekwa nsọpụrụ nʼebe Onye nsọ nke Izrel nọ.
ISA 17:8 Nʼụbọchị ahụ, ha agaghị elekwasịkwa chi ha dị iche iche anya ka ha nyere ha aka. Ha agakwaghị efe ihe ndị ahụ ha ji aka ha mee. Ha agakwaghị asọpụrụ chi nwanyị ha bụ Ashera, maọbụ ebe ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ nke mkpịsịaka kpụrụ.
ISA 17:9 Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe.
ISA 17:10 Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị. I chetaghị Nkume ahụ, nke bụ ebe mgbaba gị. Ya mere, ọ masịkwa gị kụọ ihe ọkụkụ dị iche iche nke dị ụtọ, maọbụ manye alaka osisi vaịnị ị si nʼala ọzọ bubata,
ISA 17:11 ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị, nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị.
ISA 17:12 Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme, nke yiri mkpọtụ oke osimiri. Ọ bụ mkpọtụ nke mba dị iche iche; ha na-eme mkpọtụ dị ka nnugharị nke ọtụtụ osimiri.
ISA 17:13 Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri, ma Chineke ga-abara ha mba nke ga-eme ka ha gbaa ọsọ. A ga-achụsa ha dịka ifufe si efesa igbugbo ọka, na dịka mpempe akwụkwọ ifufe siri ike na-ebugharị gburugburu gburugburu.
ISA 17:14 Nʼanyasị, ha na-eme ka oke egwu dịrị, tutu ruo ụtụtụ, ha adịghịkwa. Nke a bụ ihe nketa dịịrị ndị ahụ na-apụnara anyị ihe anyị nwere nʼike. E, ọ bụ ihe nza ruru ndị ahụ ji ike na-anakọrọ anyị ihe anyị nwere.
ISA 18:1 Ahụhụ ga-adịrị ala ahụ a na-anụ ụzụ ọtụtụ nku nʼime ya, ala ahụ dị nʼofe iyi ukwu niile nke Kush.
ISA 18:2 Ala nke na-ezipụ ndị ozi ya site nʼosimiri, bụ ndị na-eji ụgbọ mmiri papịrọs nʼaga nʼelu mmiri. Gaanụ ngwangwa, unu ndị ozi dị nkọ gakwuru ndị toro ogologo nke ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ, gakwuru ndị a na-atụ egwu nʼebe niile, mba na-achọ okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa, ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.
ISA 18:3 Unu niile bi nʼelu ụwa dum, na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị. Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile, lee anya; mgbe a fụrụ opi ike, gee ntị.
ISA 18:4 Nʼihi na ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị gwara m, “Aga m anọ jụụ na-elepụ anya site nʼebe obibi m, dịka mgbe igirigi na-ada nʼoge okpomọkụ nke owuwe ihe ubi, na dịka anyanwụ si acha nʼoge okpomọkụ.”
ISA 18:5 Nʼihi na tupu oge owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru dapụsịrị, mgbe okoko na-aghọ mkpụrụ vaịnị nke ka na-achata achata, ọ ga-eji mma oge gbuchapụ ụmụ alaka ya, ọ ga-egbutu ma wezugakwa alaka ndị ahụ na-awasa awasa.
ISA 18:6 A ga-ahapụ ozu ndị agha ha ka anụ ufe nke ugwu na ụmụ anụ ọhịa rie ha. Ụmụ nnụnụ ga-eri anụ ha nʼoge okpomọkụ, ma ụmụ anụ ọhịa ga-eri ha nʼoge oyi.
ISA 18:7 Ma mgbe ahụ, a ga-ewetara Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye dị iche iche, site na ndị toro ogologo, ndị ahụ na-akwọ mụrụmụrụ, site na ndị a na-atụ egwu nʼebe niile, bụ mba ndị okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa, ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha. A ga-eweta onyinye a nʼUgwu Zayọn, nʼebe ahụ a na-akpọku aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
ISA 19:1 Nke a bụ amụma megide Ijipt: Lee, Onyenwe anyị na-abịa imegide Ijipt, ọ na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ. Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya. Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha.
ISA 19:2 “Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha. Nwanne ga-emegide nwanne ya, onye agbataobi ga-emegidekwa onye agbataobi ya; obodo ga-emegide isi obodo; otu a kwa, alaeze ga-emegidekwa alaeze.
ISA 19:3 Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha, aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu, ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa.
ISA 19:4 Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị, Ọ bụ nʼaka eze afọ tara mmiri, nke na-adịghị eme ebere, ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka ọ bụrụ onye ga-achị ha.”
ISA 19:5 Mmiri dị nʼosimiri ga-atada; ọ ga-atakwa takọrọkwa.
ISA 19:6 Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị ga-atalata bido nʼisi isi. Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa.
ISA 19:7 Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ, ifufe ga-efesakwa ha. Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi, ihe niile ga-anwụ.
ISA 19:8 Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa, na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl, ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri ga-ata ahụ.
ISA 19:9 Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ, na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ.
ISA 19:10 Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego, ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ.
ISA 19:11 Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ, ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye. Ị ga-esi aṅaa gwa Fero, “Abụ m otu nʼime ndị maara ihe, onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie”?
ISA 19:12 Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a? Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara, ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere megide Ijipt.
ISA 19:13 Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu, ndịisi obodo Memfis aghọkwaala ndị e duhiere eduhie; ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niile eduhiela ndị Ijipt ụzọ.
ISA 19:14 Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha mmụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke; nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-eme dịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ.
ISA 19:15 Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime, isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara.
ISA 19:16 Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha.
ISA 19:17 Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.
ISA 19:18 Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ.
ISA 19:19 Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt. A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha.
ISA 19:20 Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha.
ISA 19:21 Ya mere, Onyenwe anyị ga-eme ka ndị Ijipt mara onye ọ bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata Onyenwe anyị, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe Onyenwe anyị nkwa debekwa ya.
ISA 19:22 Onyenwe anyị ga-eti Ijipt ihe otiti, ma ọ ga-agwọkwa ha. Ndị Ijipt ga-alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-aṅakwa ntị nʼarịrịọ ha gwọọkwa ha.
ISA 19:23 Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe okporoụzọ atụliri atụli nke ga-esite na Ijipt ruo Asịrịa. Ndị Asịrịa ga-aga Ijipt, ndị Ijipt ga-agakwa Asịrịa, ndị Ijipt na ndị Asịrịa ga-eso fee ofufe.
ISA 19:24 Nʼụbọchị ahụ ka Izrel ga-abụ nke atọ imezu Ijipt na Asịrịa, bụrụ ngọzị nʼụwa.
ISA 19:25 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-agọzi ha, na-asị, “Ka ngọzị dịrị Ijipt, ndị m, dịrị Asịrịa nke bụ akaọrụ m, na Izrel ihe nketa nke m.”
ISA 20:1 Nʼafọ ahụ, Sagọn, eze Asịrịa, zipụrụ ọchịagha onye ọkwa ya kasị ukwuu, ka ọ gaa buso Ashdọd agha. Ọ gara meriekwa ya nʼagha.
ISA 20:2 Nʼoge ahụ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ Aịzaya nwa Emọz. Ọ sịrị ya, “Yipụ uwe mkpe iyi nʼahụ, ya na akpụkpọụkwụ dị gị nʼụkwụ.” O mere otu a, ọ gbaara ọtọ, jegharịakwa nʼụkwụ efu.
ISA 20:3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Dị ka ohu m Aịzaya si gbara ọtọ jegharịa nʼụkwụ efu afọ atọ ndị a niile, ọ bụ ihe ama na ihe ịdọ aka na ntị na-egosi ihe gaje ịbịakwasị ndị Ijipt na ndị Kush.
ISA 20:4 Nʼihi na otu a ka eze Asịrịa ga-esi kpụrụ ndị Ijipt na ndị Kush ọ dọtara nʼagha. Ha ga-agba ọtọ na-ejegharị nʼụkwụ efu, ma nwantakịrị ma okenye. Otule ha gba ọtọ ga-abụrụ Ijipt ihe ihere.
ISA 20:5 Egwu ga-ejide ndị ahụ niile nwere nchekwube nʼike Kush, na ndị ahụ niile jiri Ijipt nyaa isi ga-ada mba. Ihere ga-emekwa ha.
ISA 20:6 Nʼụbọchị ahụ, ndị ahụ dịnyeere ha, bụ ndị bi nʼọnụ mmiri ha ga-asị, ‘Ọ bụrụ na ihe dị otu a dakwasịrị ndị Ijipt anyị tụkwasịrị obi inyere anyị aka, na ịnapụta anyị site nʼaka eze Asịrịa, ebeekwanụ ka anyị ga-agbaga?’ ”
ISA 21:1 Amụma megide ọzara nke dị nʼakụkụ oke osimiri: Dịka oke ifufe si nʼọzara Negeb na-efebiga, ka onye na-eme ihe ike ga-esi nʼọzara bịa, site nʼala nke oke egwu.
ISA 21:2 Ahụrụ m ọhụ dị egwu, ọhụ oke mbibi, na ọhụ oke nrara nye nʼaka ndị mbibi, nʼebe onye na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-akwakọta ngwongwo. Bilienụ unu ndị agha Elam, buonu agha! Unu ndị agha Midia, gbaanụ obodo gburugburu! Aga m eme ka ịsụ ude na mmegbu niile kwụsị.
ISA 21:3 Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu, oke ihe mgbu zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme. Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ, ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya.
ISA 21:4 Obi m anọkwaghị jụụ, oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu; chi ojiji nke m na-ele anya ya aghọọlara m ihe ịma jijiji.
ISA 21:5 Ha na-akwado tebul. Ha na-edozi ute ịnọdụ ala, ha na-eri, ha na-aṅụ. Bilienụ ndịisi agha, teekwanụ ọta niile mmanụ!
ISA 21:6 Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzobe onye nche, ka o kwuo ihe ọ na-ahụ.
ISA 21:7 Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha, na usuu ịnyịnya, na ndị na-agba ịnyịnya ibu, maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ, gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma, nọọkwa na njikere.”
ISA 21:8 Onye nche na-elepụ anya tiri mkpu dịka ọdụm, sị, “Onyenwe m, nʼehihie ụbọchị niile ka m na-eguzo nʼelu ụlọ nche, nʼọnọdụ nche m ka m na-eguzokwa abalị niile.
ISA 21:9 Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa, ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ. O nyeghachiri ọsịsa ahụ, ‘Babilọn adaala, e ọ daala, arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ ”
ISA 21:10 O, ndị m, ndị a zọchara azọcha, dịka ọka a zọchara nʼebe ịzọcha ọka, agwala m unu ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru.
ISA 21:11 Nke a bụ amụma megide Duma: Otu onye si na Sia na-akpọ m oku, “Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ? Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?”
ISA 21:12 Onye nche zara sị, “Chi ọbụbọ na-abịa, abalị na-abịakwa. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịjụ ajụjụ, jụọnụ ajụjụ, ma laghachikwa ọzọ.”
ISA 21:13 Amụma megide Arebịa: Unu ndị ije niile nke Dedan, ndị na-anọ ọnọdụ abalị nʼoke ọhịa nke Arebịa,
ISA 21:14 kuterenụ ndị ahụ bịakwutere unu akpịrị na-akpọ nkụ mmiri ọṅụṅụ; unu ndị bi nʼala Tema, buterenụ ndị gbakwutere unu ọsọ ndụ nri.
ISA 21:15 Nʼihi na ọ bụ site nʼagha nke e ji mma agha egbu ndị mmadụ, na agha e ji akụ agbatu mmadụ ka ha si na-agbapụ ọsọ.
ISA 21:16 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị m, “Tupu otu afọ agwụ, dị ka esi agụ afọ onye ohu e goro ọrụ, ịma mma Keda ga-agwụsị.
ISA 21:17 Ndị fọdụrụ ndụ nʼime ndị na-agba ụta, ndị bụ dike nʼagha na Keda, ga-adị mmadụ ole na ole.” Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel ekwuola ya.
ISA 22:1 Amụma megide ndagwurugwu nke ọhụ. Ọ bụkwa gịnị na-eme unu ugbu a nke mere na unu niile rịgooro nʼelu ụlọ?
ISA 22:2 Gị obodo jupụtara nʼoke ọgbaaghara, gị obodo oke ụzụ na-aṅụrị obi ụtọ? Ndị unu niile nwụrụ anwụghị nʼime ọgbọ agha, ma ọ bụkwanụ site na mma agha.
ISA 22:3 Ndịisi unu niile agbapụchaala. E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ. Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya.
ISA 22:4 Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m; ka m bee akwa dị ilu. Unu anwakwala ịkasị m obi, nʼihi mbibi e bibiri ndị m.”
ISA 22:5 Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị, nʼime ndagwurugwu nke ọhụ, ọ bụ ụbọchị itida mgbidi na nke itiku ugwu niile mkpu akwa.
ISA 22:6 Elam bu akpa àkụ, ya na ndị nọkwasịrị nʼelu ụgbọala na ịnyịnya ha; Kia ewepụtakwala ọta.
ISA 22:7 Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma; ndị na-agba ịnyịnya anọchisiela ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼobodo unu.
ISA 22:8 Onyenwe anyị wezugara ihe nchedo niile nke Juda, nʼụbọchị ahụ unu legidere anya na ngwa agha dị nʼỤlọeze dị nʼOke ọhịa.
ISA 22:9 Unu hụrụ na mgbidi obodo Devid nwere ọtụtụ mgbawa nʼebe dị iche iche na ya. Unu chekọtara mmiri nʼọdọ mmiri nke ala ala.
ISA 22:10 Unu gụrụ ụlọ dị na Jerusalem ọnụ, tiwaa ụfọdụ ụlọ iji mee ka mgbidi sie ike.
ISA 22:11 Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ maka ichekwa mmiri si nʼọdọ mmiri ochie, ma unu elekwasịghị Onye ahụ kere ya anya, unu ejikwaghị Onye ahụ tụrụ atụmatụ ya site na mgbe gara aga kpọrọ ihe.
ISA 22:12 Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọrọ unu ụbọchị ahụ ka unu kwaa akwa, ruo ụjụ, kpụchaa agịrị isi unu ma yirikwa akwa mkpe.
ISA 22:13 Ma lee, e nwere obi ụtọ, na-egwuri egwu; igbu ehi na igbu atụrụ, iri anụ nakwa ịṅụ mmanya. Unu na-asị, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi ka anyị ga-anwụ.”
ISA 22:14 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpugheerala m mee ka m nụrụ, “Nʼezie, agaghị ekpuchiri unu mmehie a ruo ụbọchị unu ga-anwụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
ISA 22:15 Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru: “Gaa, gwa odozi akụ a bụ Shebna, nke bụ onye na-elekọta ụlọ ukwu eze:
ISA 22:16 Gịnị ka ị na-eme nʼebe a, onye nyekwara gị ikike na i gwuwaara onwe gị ili nʼebe a, na-egwuwakwa ili gị nʼebe dị elu na-akapụtara onwe gị ebe izuike nʼime nkume ahụ?
ISA 22:17 “Kpachara anya, Onyenwe anyị na-aga ịkpata gị aka, tufuo gị nʼebe dị anya, gị dike na nwoke.
ISA 22:18 Ọ ga-afịkọta gị okirikiri dịka bọlụ, tufuo gị nʼobodo sara mbara. Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nwụọ, nʼebe ahụ kwa ka ụgbọala gị nke i ji anya isi ga-aghọ ihe ihere nye ezinaụlọ onyenwe gị.
ISA 22:19 Onyenwe anyị ga-achụpụkwa gị site nʼọkwa gị, na sitekwa nʼọnọdụ gị dị elu, dọda gị nʼala.
ISA 22:20 “Nʼụbọchị ahụ, aga m akpọ ohu m, Eliakịm, nwa Hilkaya.
ISA 22:21 Aga m eyikwasị ya uwe ọrụ gị, kekwasịkwa ya ihe ike nʼukwu, werekwa ike ọchịchị ahụ i nwere na mbụ nyefee ya. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem na ndị Juda nna.
ISA 22:22 Aga m enyefekwa ya nʼaka ihe ntụghe ụzọ nke ụlọ Devid. A ga-emeghe ihe niile ọ sị na a ga-emeghe, mechiekwa ihe niile ọ sị na a ga-emechi,
ISA 22:23 Aga m eme ka o guzosie ike dịka ǹtu a kpọgidere nʼaja ụlọ. Ocheeze ya ga-ewetara ụlọ nna ya nsọpụrụ.
ISA 22:24 A ga-ekokwasị ya ebube nke ezinaụlọ ya, ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya, ihe niile nke dị nta, site na ite na efere, sitekwa nʼọba ruo na karama niile.
ISA 22:25 “Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, “Nʼoge ahụ, ǹtu ahụ a kpọgidesịrị ike nʼaja ụlọ ga-apụ nʼọnọdụ ya, a ga-akpajipụ ya ọ dapụ nʼala. Ibu niile nke kokwasịrị nʼelu ya ka a ga-egbuda nʼala.” Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya.
ISA 23:1 Nke a bụ amụma megide Taịa: Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri nke Tashish nʼihi na e bibiela Taịa, ahapụla ya na-enweghị ụlọ ọbụla maọbụ ọnụ mmiri mbata. Ozi erutela ha aka site nʼobodo Saiprọs.
ISA 23:2 Derenụ duu, unu ndị bi nʼala ahụ osimiri gbara gburugburu. Unu ndị na-azụ ahịa na Saịdọn, ndị na-ezipụ ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri, kwaanụ akwa.
ISA 23:3 Nʼelu ọtụtụ mmiri dị ukwuu, ka mkpụrụ ọkụkụ Shihoa si bịa, owuwe ihe ubi nke Naịl bụ ihe uru ahịa Taịa, ọ ghọrọ ọma ahịa nke mba dị iche iche.
ISA 23:4 Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri, nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu; “Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa; o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.”
ISA 23:5 Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt, ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa.
ISA 23:6 Gabiganụ ruo Tashish tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu.
ISA 23:7 Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile? Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga? Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ?
ISA 23:8 Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa, bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze, mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze, nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa?
ISA 23:9 Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya, nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile, na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị.
ISA 23:10 Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl, unu ụmụada Tashish, nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri.
ISA 23:11 Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri mee ka alaeze ha niile maa jijiji. O nyela iwu banyere Fonisia ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike.
ISA 23:12 Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ, gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu. “Bilie, gafee garuo Saiprọs, ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.”
ISA 23:13 Lee anya nʼala ndị Kaldịa, ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ! Ndị Asịrịa mere ya ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara. Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike, mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe.
ISA 23:14 Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri, nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike.
ISA 23:15 A gaghị echeta Taịa ọzọ, tutu iri afọ asaa agafee, nke bụ ogologo ụbọchị ndụ onye eze. Mgbe oge ahụ zuru, Taịa ga-adịkwa ka nwanyị akwụna e jiri rọọ abụ dị otu a:
ISA 23:16 “Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo, gị nwanyị akwụna e chefuru echefu; kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ, ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta.”
ISA 23:17 E, mgbe iri afọ asaa gasịrị, Onyenwe anyị ga-eleta Taịa. Ọ ga-alaghachi nʼọrụ ya dịka nwanyị akwụna, ya na alaeze niile dị nʼihu elu ụwa niile.
ISA 23:18 Ma uru ahịa ya niile, na ego niile ọ kpatara site nʼịzụ ahịa ka ọ ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị. Ha agaghị edokọkwa ha nʼotu ebe izo ha, kama uru ahịa ha niile ga-adịrị ndị niile na-ebi ezi ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-ejikwa ego ahụ zụọ ihe oriri na uwe dị mma.
ISA 24:1 Lee, na Onyenwe anyị na-aga ịgba ụwa ọtọ. Ọ na-aga ime ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ọ na-aga ibibicha ihe dị nʼelu ụwa, mee ka ndị bi nʼime ya gbasasịa.
ISA 24:2 Otu ihe ahụ ka ọ ga-eme mmadụ niile, nye ndị nchụaja ma ndị mmadụ, nye ụmụodibo na ndị nwe ha, nye ndị odibo nwanyị, na nne ha ukwu, nye ndị na-azụ ihe a na-ere ere, na ndị na-ere ihe orire; nye ndị na-ebinye ego, na ndị a na-ebinye ego; nye ndị ji ụgwọ, na ndị e ji ụgwọ.
ISA 24:3 O nweghị onye ọ ga-ahapụ. A ga-agba ala ahụ ọtọ kwakọrọ ihe niile dị nʼime ya. Nke a ka Onyenwe anyị kwuru.
ISA 24:4 Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ. Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ. Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya.
ISA 24:5 Ụwa bụ ihe e merụrụ emerụ site na ndị ya; ha enupula isi nʼiwu niile, ha agbanweela ụkpụrụ ya, mebie ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ.
ISA 24:6 Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa; ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha. Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ, ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ.
ISA 24:7 Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala, nʼihi ya, ndị ahụ niile ọṅụ na-ejupụta nʼobi ha na-asụ ude.
ISA 24:8 Egwu ụtọ niile akwụsịla, mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla. Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa.
ISA 24:9 Abụ obi ụtọ nke ya na mmanya na-eso adịghịkwa; mmanya dị ike na-akụzi ilu nʼọnụ ndị na-aṅụ ya.
ISA 24:10 Obodo atọgbọrọla nʼefu; a kpọchichaala ọnụ ụzọ e si abata ụlọ ndị mmadụ ka onye ọbụla ghara inwe ike ịbata.
ISA 24:11 Igwe ndị mmadụ nọ nʼokporoụzọ na-eti mkpu nʼihi na mmanya adịghịkwa. Ọṅụ adịghịkwa, otu a, ewezugakwala obi ụtọ site nʼụwa.
ISA 24:12 Obodo ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe, e tikpọọla ọnụ ụzọ ya niile.
ISA 24:13 Otu a ka ọ ga-adị nʼụwa niile, nakwa nʼetiti mba niile, dịka mgbe a na-etitusi mkpụrụ dị nʼelu osisi oliv, maọbụ mgbe ahapụrụ ụfọdụ mkpụrụ grepu nʼelu osisi mgbe a ghọchasịrị ihe ubi.
ISA 24:14 Ma ndị niile fọdụrụ ga-eti mkpu ọṅụ; ndị nọ nʼọdịda anyanwụ ga-eto ịdị ebube nke Onyenwe anyị.
ISA 24:15 Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye Onyenwe anyị otuto. Ndị bi nʼala nta niile osimiri gbara gburugburu ga-ebuli aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel elu.
ISA 24:16 Anyị ga-anụ abụ ọma dị iche iche site na nsọtụ ụwa. Ha ga-abụ abụ na-asị, “Otuto dịrị Onye ezi omume ahụ.” Ma nʼezie, o nweghị olileanya dịịrị m. “Lee ka anụ ahụ m si na-akpọnwụ! Ahụhụ dịrị m! Nʼihi na ndị ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi ereela anyị. Akpịrị ego ha ka ha ji refuo anyị.”
ISA 24:17 Ihe egwu, na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya dị na-eche unu, unu ndị niile bi nʼụwa.
ISA 24:18 Onye ọbụla nʼime unu nke gbara ọsọ nʼihi ihe egwu ga-adaba nʼolulu; onye ọbụla sitekwara nʼolulu rịpụta ga-azọnye ụkwụ ya nʼọnya. Nʼihi na mmiri nke ịla nʼiyi esitela na mbara eluigwe na-ezokwasị unu. Ntọala ụwa na-amakwa jijiji.
ISA 24:19 Ụwa adapịasịala; ụwa agbawasịala; e jirila oke ike nugharịa ụwa.
ISA 24:20 Ụwa ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu. Ọ ga-aṅagharịkwa dịka osisi nke oke ifufe na-efegharị. Ọ daala, ọ pụghịkwa ibili ọzọ, nʼihi na njehie ya dị arọ na-anyịdakwa ya.
ISA 24:21 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ata ike usuu niile dị nʼeluigwe ahụhụ. Ọ ga-atakwa ndị eze niile nʼụwa ahụhụ.
ISA 24:22 A ga-achịkọta ha dịka ndị mkpọrọ, kpọchiekwa ha nʼụlọ mkpọrọ nʼebe ahụ ka ha ga-anọgide, tutu ruo mgbe a ga-ekpe ha ikpe.
ISA 24:23 Ọnwa ga-ada mba, anwụ ka ihere ga-eme; nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-achị nʼugwu Zayọn nakwa nʼime Jerusalem, ọ ga-eji oke ebube chịa nʼihu ndị okenye ya.
ISA 25:1 O Onyenwe anyị, ị bụ Chineke m; aga m ebuli gị elu, nye aha gị otuto, nʼihi na site na ntụkwasị obi zuruoke, ị rụọla ọtụtụ ihe ịrịbama, nke i tụrụ atụmatụ ha siterị nʼoge gara aga.
ISA 25:2 Nʼihi na i meela ka obodo ghọọ mkpọmkpọ ebe; mee ka obodo e wusiri ike ghọọ ebe dakpọrọ adakpọ; meekwa ka ebe siri ike nke ndị mba ọzọ ghọọ ebe obodo na-adịghịzi, agaghị ewukwa ya ruo mgbe ebighị ebi.
ISA 25:3 Nʼihi nke a, ndị niile dị ike ga-asọpụrụ gị. Obodo ndị ahụ na-emenye ndị mba ọzọ egwu ga-atụ gị egwu.
ISA 25:4 Nʼihi na ị bụụrụ onye na-enweghị ike ebe mgbaba; ị bụkwaara ndị ogbenye ebe mgbaba nʼoge mkpa ha, ebe nchebe siri ike nʼoge oke mmiri ozuzo, na ndo nʼoge okpomọkụ. Nʼihi na nkuume nke ndị na-adịghị emere mmadụ ebere dị ka oke mmiri ozuzo nke na-amakwasị mgbidi,
ISA 25:5 dịkwa ka okpomọkụ nke na-adị nʼọzara. Ị na-eme ka mkpọtụ nke ndị mba ọzọ kwụsị, dịka ndo nke igwe ojii na-eweta si eme ka okpomọkụ dajụọ, otu a ka abụ ọma nke ndị na-adịghị eme ebere si kwụsị.
ISA 25:6 Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri. Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile. Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị.
ISA 25:7 Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ, nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile, nke kpuchikwara ihu ndị mba niile.
ISA 25:8 Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile site nʼihu mmadụ niile, ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta niile dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile. Onyenwe anyị ekwuola ya.
ISA 25:9 Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị, “Nke a bụ Chineke anyị nʼezie, anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị. Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi, ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.”
ISA 25:10 Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a, ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha, dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ.
ISA 25:11 Ha ga-agbasa aka ha abụọ nʼime ya, dịka onye na-egwu mmiri si agbasapụ aka ya, ma Chineke ga-eweda mpako ha niile, nʼagbanyeghị ọrụ aghụghọ niile nke aka ha.
ISA 25:12 Ọ ga-akwatu mgbidi gị niile dị elu nke e wusiri ike, mee ka ha daruo ala, ọ ga-eme ka ha daruo ala, ruo mgbe ha ghọrọ uzuzu.
ISA 26:1 Nʼụbọchị ahụ, a ga-abụ abụ a nʼala Juda niile: Anyị nwere obodo e wusiri ike. Chineke na-eme ka mgbidi ya na ebe ya niile e wusiri ike bụrụ nzọpụta nye anyị.
ISA 26:2 Meghee ụzọ ama niile, ka mba ndị ahụ na-eme ezi omume bata, e, bụ mba ahụ kwesiri ntụkwasị obi.
ISA 26:3 Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike nwee udo zuruoke, nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha.
ISA 26:4 Tụkwasị Onyenwe anyị Chineke obi mgbe niile, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi.
ISA 26:5 Ndị na-akpa nganga ka ọ na-ewedata ala, na-emekwa ka obodo na-anya isi kpọọ ọnụ nʼala. Mgbidi ya ka ọ na-eme ka ọ daruo ala.
ISA 26:6 Ọ na-enyefe obodo ahụ nʼaka ndị a na-emegbu emegbu, na nʼaka ndị ogbenye ka ha zọtọọ ya ụkwụ.
ISA 26:7 Ụzọ nke onye ezi omume ha nʼotu, gị, Onye ziri ezi, na-eme ka okporoụzọ ndị ezi omume dị larịị.
ISA 26:8 E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile, na-ele anya gị. Aha gị na ihe niile e ji mara gị bụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike.
ISA 26:9 Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike, nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike, nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpe ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe.
ISA 26:10 Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọ adịghị eme ka ha gbanwee. Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ. Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị.
ISA 26:11 Onyenwe anyị ebuliela aka ya elu, ha adịghị ahụ ya. Gosi ha ekworo gị banyere ndị gị, ka e si otu a mee ka ihere mee ha. E, ka ọkụ ahụ ị kwadooro ndị iro gị rechapụ ha.
ISA 26:12 Onyenwe anyị, ị na-enye anyị udo; nʼihi na ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị.
ISA 26:13 O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ọ dị mgbe anyị nọ nʼokpuru ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche, ma ugbu a, ọ bụ naanị aha gị ka anyị na-efe.
ISA 26:14 Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ; mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ. Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi; e chefukwaala ha.
ISA 26:15 I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị; i meela ka mba a saa mbara. I wetarala onwe gị nsọpụrụ, i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa.
ISA 26:16 Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị. Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha, ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere.
ISA 26:17 Gị, Onyenwe anyị, emeela ka anyị kwaa akwa, dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu. Otu a ka anyị nọ nʼihu gị.
ISA 26:18 Anyị anọọla ọnọdụ ihe mgbu, na ịta ikikere eze, ma o nweghị ihe ọma anyị nwetara nʼime ya. Mgbalị anyị niile emeghị ka nzọpụta rute ụwa aka. O nwekwaghị ihe nwere isi anyị rụpụtara.
ISA 26:19 Ma ndị gị niile nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, O Onyenwe anyị. Ozu ha ga-esite nʼọnwụ bilie. Unu ndị niile bi nʼaja tetanụ ma tie mkpu ọṅụ. Nʼihi na igirigi gị dị ka igirigi nke ụtụtụ, ala ga-amụpụtakwa ndị ya niile nwụrụ anwụ.
ISA 26:20 Baanụ nʼụlọ, ndị m, kpọchienụ ụzọ unu! Zoonụ onwe unu naanị nwa oge nta, tutu ruo mgbe iwe Chineke ga-agabiga.
ISA 26:21 Lee anya! Onyenwe anyị si nʼebe obibi ya na-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile. Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya, ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya.
ISA 27:1 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji mma agha ya iwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike, taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ. Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ; ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri.
ISA 27:2 Nʼụbọchị ahụ, abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ.
ISA 27:3 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya, ana m agba ya mmiri ụbọchị niile, na-eche ya nche ehihie na abalị. Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya.
ISA 27:4 Adịghị m ewekwa iwe. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ogwu na uke na-echere m aka mgba, aga m ebili buso ha agha, aga m esurekwa ha ọkụ.
ISA 27:5 Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa, ha bịa ka mụ na ha mee udo. E, ha bịa ka mụ na ha mee udo.”
ISA 27:6 Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ. Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru, jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile.
ISA 27:7 Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ dịka o si taa ndị iro ya. O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya dị ka e si gbuo ndị iro ha.
ISA 27:8 Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ. Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ ka o ji bupụ ha.
ISA 27:9 Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka a ga-esi bupụ ikpe ọmụma dịrị Jekọb, nke a bụkwa iju eju nke mkpụrụ e ji wezuga mmehie ya: Mgbe ha gweriri nkume niile ha ji wuo ebe ịchụ aja arụsị ha dịka ntụ, mgbe ha wezugara ogidi arụsị Ashera, na ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile.
ISA 27:10 Obodo ahụ e wusiri ike adakpọsịala. Ọ ghọọla ọzara nke ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya. Ọ ghọọkwala ebe ụmụ ehi na-akpa nri, ebe ha na-amakpu na-ezu ike. Ha ga-atacha ahịhịa dị nʼalaka osisi.
ISA 27:11 Mgbe alaka osisi ndị ahụ kpọnwụrụ daa, ụmụ nwanyị ga-abịa chịkọtaa ha were ha kwanye ọkụ. Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enweghị nghọta. Ọ bụ nke a mere Onye kere ha adịghị emere ha ebere. Onye ahụ kpụrụ ha agakwaghị egosi ha obi ebere.
ISA 27:12 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ahọcha site nʼebe mmiri na-eru eru Yufretis ruo na Wadi nke Ijipt, ma gị, bụ Izrel ka a ga-achịkọta otu nʼotu.
ISA 27:13 Nʼụbọchị ahụ, opi ike ga-ada. Ndị ahụ na-ala nʼiyi nʼAsịrịa na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri nʼIjipt dịka ndị mba ọzọ ga-abịa fee Onyenwe anyị ofufe nʼugwu nsọ ya dị na Jerusalem.
ISA 28:1 Ahụhụ ga-adịrị okpueze okoko ọhịa ahụ, nke bụ mpako Ifrem, obodo ahụ ndị ya na-aṅụbiga mmanya oke ji anya isi. Obodo ahụ e wukwasịrị na mbara ala ndagwurugwu mara mma. Obodo ahụ ịma mma ya na-ada dịka okoko osisi e kpukwasịrị ndị ndu ya mmanya na-egbu nʼisi.
ISA 28:2 Lee, Onyenwe anyị nwere otu onye dị ike, onye nwekwara ume, dịka oke mmiri ozuzu nke akụmmiri igwe na dịka oke ifufe na-eweta mbibi, dịka oke mmiri ozuzo na-erubiga oke na dịka oke mmiri ozuzo bu idee mmiri ji ike ekwo, ọ ga-eji ike tụpụ ya nʼala.
ISA 28:3 Okpueze okoko osisi, bụ mpako nke ndị Ifrem na-aṅụbiga mmanya oke, ga-abụ ihe a ga-azọtọkwa nʼokpuru ụkwụ.
ISA 28:4 Okoko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ, nke bụ ebube ịma mma ya, nke dị nʼisi ndagwurugwu na-emepụta ihe, ga-adị ka mkpụrụ fiig chara tupu oge owuwe ihe ubi eruo, nke mgbe onye ọbụla hụrụ ha na-ewere ha nʼaka, tinye nʼọnụ ya, loo ha.
ISA 28:5 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nʼonwe ya, ga-aghọrọ ndị ya fọdụrụ nʼala ahụ okpueze mara mma, ọ ga-aghọkwara ha okoko mara mma.
ISA 28:6 Ọ ga-abụ mmụọ nke ikpe ziri ezi nye ndị ikpe. Ọ ga-abụkwa ike nye ndị na-achụghachi ndị iro azụ nʼọnụ ụzọ ama.
ISA 28:7 Ndị a kwa na-adagharị site na mmanya sitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya. Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya, mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme; ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya ha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche, ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe.
ISA 28:8 Nʼihi na tebul ha niile jupụtara nʼihe ọgbụgbọ ruru unyi. O nwekwaghị ebe dị ọcha.
ISA 28:9 “Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ikuziri ihe? Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ka ọ ghọta ozi ya? Ọ bụ ụmụnta ndị a kwusịrị ịṅụ mmiri ara, bụ ndị a ka napụrụ ara?
ISA 28:10 Nʼihi na ọ na-agbalị izi anyị ihe dịka e si dee ya, ahịrị ime nke a, nʼahịrị ime nke ọzọ, nʼusoro tụkwasị nʼusoro, nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ.”
ISA 28:11 Nʼezie, Chineke ga-eji ndị na-asụ asụsụ unu na-amaghị zi unu ihe.
ISA 28:12 Nʼihi na ọ gwara unu okwu sị, “Lee, nke a bụ ebe izuike ahụ, ebe onye ike gwụrụ nwere ike ịnọ zuru ike; nke a bụ ebe ịgbaume ahụ.” Ma ha jụrụ ige ya ntị.
ISA 28:13 Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu Onyenwe anyị nʼahịrị nʼahịrị, nʼusoro nʼusoro; nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ, ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ, ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara.
ISA 28:14 Nʼihi nke a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-akwa emo, ndị ọchịchị Jerusalem dị nʼaka.
ISA 28:15 Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ, anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi. Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee, ọ gaghị erute anyị, nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị; ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.”
ISA 28:16 Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke anwapụtarala. Nkume nkuku dị oke ọnụahịa, nʼihi ntọala siri ike. Onye nke kweere na ya egwu agaghị ejide ya.
ISA 28:17 Ikpe ziri ezi ga-abụ eriri ọtụtụ nke ji atụ ihe, ezi omume ga-abụkwa ihe ịtụ mgbidi; akụmmiri nke oke mmiri ozuzo, ga-ekpochapụ ebe mgbaba unu, okwu ụgha unu, mmiri ga-etojukwa nʼebe nzuzo unu.
ISA 28:18 Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara; mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa. Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-azọda unu.
ISA 28:19 Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu, maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị, oge niile, mgbe mgbe.” Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke; ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji.
ISA 28:20 Ihe ndina dị mkpụmkpụ, mmadụ enweghị ike esetipụ onwe ya nʼelu ya; akwa mkpuchi dị oke warawara, mmadụ enweghị ike iji ya fụchizie ahụ nke ọma.
ISA 28:21 Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim, ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn, ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa, na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya.
ISA 28:22 Ugbu a, ya mere, kwụsịnụ ịkwa emo, ka a ghara ime ka ahụhụ unu dị ukwuu karịa. Nʼihi na Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agwala m na o kpebiela ịla unu nʼiyi.
ISA 28:23 Geenụ ntị, nụrụnụ olu m, ṅaanụ ntị nʼihe m na-agwa unu.
ISA 28:24 Ọ bụ ụbọchị niile ka onye ọrụ ubi na-akọ ala ubi ya hapụ ịkụnye ya mkpụrụ? Ọ bụ mgbe niile ka ọ na-egwuze ala ubi ya ime ka ọ dị larịị, ma ọ gaghị akụnye ya mkpụrụ ọbụla?
ISA 28:25 Mgbe o gwuzesịrị ya, ọ naghị aghasa mkpụrụ karawe, ghasaakwa kumin? Ọ bụ na ọ naghị akụnye ọka wiiti nʼahịrị nke ya, ọka balị nʼebe o kwesiri, na spelti nʼebe o kwesiri?
ISA 28:26 Ọ maara ihe o kwesiri ime, nʼihi na Chineke na-ezi ụzọ ziri ezi.
ISA 28:27 Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe, maọbụ kpọree ụkwụ igwe nʼelu kumin, kama ọ bụ mkpọrọ ka e ji etichapụta kumin, werekwa osisi nta kwesiri ekwesi kupụta karawe.
ISA 28:28 A na-akwọ ọka e ji eme achịcha akwọ, ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a na-anọgide na-etichapụta ya. E nwere ike jiri ụkwụ igwe ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ zọchaa ha, ma ọ bụghị ka a kwọpịasịa mkpụrụ ha.
ISA 28:29 Ihe ndị a niile na-esite nʼaka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-abịa, onye nzube ya dị ịtụnanya, onye amamihe ya dị ebube.
ISA 29:1 Ahụhụ ga-adịrị gị, gị bụ Ariel, Ariel, gị obodo ebe Devid bi. Gbakọnyenụ otu afọ nʼafọ ọzọ nke unu ga-eji rie oriri, mee mmemme.
ISA 29:2 Ma aga m akpagbu Ariel, ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa, ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja.
ISA 29:3 Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu, aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburu dokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị.
ISA 29:4 Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala, okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta. Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala, ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta.
ISA 29:5 Ma igwe ndị iro gị ga-aghọ ntụ, igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu. Mgbe ahụ, na mberede,
ISA 29:6 mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji egbe eluigwe na ala ọma jijiji na oke ifufe na oke ụzụ, na ọkụ na-erepịa erepịa, bịakwute ha.
ISA 29:7 Mba niile ahụ, ndị na-ebuso Ariel agha, bụ ndị na-ebuso ya na ebe ya e wusiri ike agha, ga-efu dịka nrọ, onye na-arahụ ụra nʼabalị rọrọ.
ISA 29:8 Dịka mgbe onye agụụ na-agụ, nke na-arọ nrọ ebe ọ na-eri nri, ma agụụ nọkwa na-agụ ya mgbe o si nʼụra teta. Dịka onye agụụ mmiri na-agụ, nke nọ na nrọ hụ mmiri ọ na-aṅụ, ma teta nʼụra chọpụta na akpịrị na-akpọsị ya nkụ ike, na-adakwa mba. E, otu a ka ọ ga-adị mgbe igwe ndị agha mba ahụ niile ga-ebuso ugwu Zayọn agha.
ISA 29:9 Ka ọ gbagwojuo unu anya. Ka o jukwa unu anya. Kpuonụ onwe unu ìsì ka unu ghara ịhụ ụzọ. Ṅagharịanụ ma ọ bụghị site na mmanya unu ṅụrụ, sọọnụ ngọngọ ma ọ bụghị site na mmanya na-aba nʼanya.
ISA 29:10 Nʼihi na Onyenwe anyị awụkwasịla unu mmụọ nke oke ụra. O mechiela anya ndị amụma unu niile, kpuchie isi ndị niile na-ahụ ọhụ.
ISA 29:11 Ihe ndị a niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu dịka akwụkwọ a kara akara. Mgbe e weere ya nye onye ma akwụkwọ ka ọ gụọ, ọ ga-asị, “Enweghị m ike, nʼihi na a kaala ya akara.”
ISA 29:12 Mgbe e weere ya nye onye na-amaghị akwụkwọ, ọ ga-asị, “Ewela iwe, amaghị m agụ.”
ISA 29:13 Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso, ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. Ofufe ha na-efe m, bụ nke gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha.
ISA 29:14 Ya mere, otu ugboro ọzọ, aga m eme ndị a ihe oke iju anya jiri ihe ịtụnanya tụkwasị nʼelu ihe ịtụnanya, amamihe nke ndị maara ihe ga-ala nʼiyi, nghọta nke ndị nwere nghọta ga-agba barịị.”
ISA 29:15 Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche na ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha, ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha, “Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!”
ISA 29:16 Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala, ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite. Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị, “Ị kpụghị m”? Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite, “Ị ghọtaghị ihe ọbụla”?
ISA 29:17 Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe, ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa?
ISA 29:18 Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ, ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha, hụkwa ụzọ ọzọ.
ISA 29:19 Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọ nke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye.
ISA 29:20 Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa; ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa, ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha,
ISA 29:21 bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara, ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya, ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka.
ISA 29:22 Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb, “Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ. Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ.
ISA 29:23 Mgbe ha hụrụ ụmụ ha, bụ ọrụ aka m abụọ, nʼetiti ha, ha ga-edo aha m nsọ, ha ga-ekwupụta, nabatakwa ịdị nsọ nke Onye nsọ Jekọb, ha ga-eguzokwa nʼihu Chineke Izrel nʼegwu na nʼịma jijiji.
ISA 29:24 Ndị na-akpafu nʼime mmụọ ha ga-enweta nghọta, ndị ntamu ga-achọkwa ka ha mụta ihe.”
ISA 30:1 “Ahụhụ ga-adịrị ụmụ ndị nnupu isi,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụ ndị na-agbaso nzube nke na-esiteghị nʼaka m, ndị ha na ndị ọzọ na-agba ndụ nke Mmụọ m na-anabataghị, si otu a na-eme ka mmehie na-aba ụba nʼelu mmehie.
ISA 30:2 Ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka ma ha ajụtaghị ase site nʼaka m. Ndị were obi ha tụkwasị na Fero maka nchebe, chọsiekwa ike ime Ijipt ebe mgbaba.
ISA 30:3 Ma nchekwa Fero ga-aghọrọ unu ihe ihere, ndo ndị Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ mweda nʼala.
ISA 30:4 Ọ bụ ezie na ha nwere ndị ozi na Zoan ndị nnọchi anya ha erutekwala Hans,
ISA 30:5 ihere ga-eme onye ọbụla nʼihi ndị na-abaghị uru nye ha, ndị na-abụghị ihe inyeaka maọbụ ihe iba uru, kama naanị ihe ihere na ịta ụta.”
ISA 30:6 Amụma banyere ụmụ anụmanụ bi na Negev. Nʼala ahụhụ na mkpagbu, nke ọdụm na nne ọdụm, nke ajụala na agwọ ọjọọ na-efe ka ọkụ, ndị nnọchite anya obodo na-ebu akụ ha niile nʼelu ịnyịnya ibu, na-ebukwa akụnụba ha dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya kamel, na-agakwuru mba ahụ na-abaghị uru,
ISA 30:7 bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi. Nʼihi nke a, ana m agụ ya Rehab, onye na-enweghị ihe ọ na-arụ.
ISA 30:8 Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume, detuokwa ha nʼime akwụkwọ, ka ọ dịrị maka ụbọchị na-abịa dịka ihe akaebe ruo mgbe ebighị ebi.
ISA 30:9 Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi Onyenwe anyị na-ezi.
ISA 30:10 Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ, “Unu ahụkwala ọhụ, o zuola,” ma sịkwa ndị amụma, “Mechienụ ọnụ! Unu ahụtakwarala anyị ihe ziri ezi nʼọhụ unu. Gwanụ anyị ihe na-atọ ụtọ na ntị, buonu amụma nduhie.
ISA 30:11 Unu na-anọchiri anyị ụzọ, nyenụ anyị ohere. Anyị achọkwaghị ịnụ ihe ọbụla banyere onye ahụ unu na-akpọ Onye dị nsọ nke Izrel.”
ISA 30:12 Ya mere, ihe a ka Onye dị nsọ nke Izrel na-ekwu, “Nʼihi na unu kpọrọ okwu m na-agwa unu asị, ma dabere na mmegbu na-atụkwasịkwa obi unu nʼaghụghọ,
ISA 30:13 mmehie a ga-aghọrọ unu ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa, nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya.
ISA 30:14 Ọ ga-etipịasị dịka ite aja, nke etipịara na-enweghị obi ebere, nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya, iji gụta ọkụ site na-ekwu, maọbụ kupụta mmiri site nʼite.”
ISA 30:15 Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị, “Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu, na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị, ma unu ekweghị na nke ọbụla.
ISA 30:16 Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’ E, unu ga-agba ọsọ nʼezie. Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’ Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa.
ISA 30:17 Otu onye nʼime ndị iro unu ga-achụ puku mmadụ nʼime unu ọsọ. Mmadụ ise si nʼime ha ezuola ịchusasị unu, ruo mgbe unu ga-adị ka osisi a manyere ọkọlọtọ debe nʼelu ugwu, e, ka ọkọlọtọ a hapụrụ nʼelu ugwu nta.”
ISA 30:18 Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya, ka o gosi unu ịhụnanya ya. O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya.
ISA 30:19 Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya.
ISA 30:20 Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha.
ISA 30:21 Ma unu tụgharịrị nʼaka nri ma ọ bụkwanụ nʼaka ekpe, ntị unu ga-anụ otu olu nʼazụ unu, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, Jeenụ ije nʼime ya.”
ISA 30:22 Mgbe ahụ kwa, unu ga-emebi arụsị unu niile, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ. Unu ga-atụfukwa ha dịka ihe ruru unyi, nke na-asọ oyi. Unu ga-asị ha, “Pụọnụ nʼebe a!”
ISA 30:23 Ọ ga-ezitekwa mmiri ozuzo maka mkpụrụ unu kụrụ nʼala ubi unu, ihe omume nke ga-esite nʼala ahụ pụta ga-ama abụba baakwa ụba. Nʼụbọchị ahụ anụ ụlọ unu ga-ata nri nʼebe ịta nri sara mbara.
ISA 30:24 Ehi na ịnyịnya ibu ndị na-arụ ọrụ ubi ga-ata nri a gwara nke ọma nke nnu dị, nke eji ngwa ọrụ ịfụcha ọka na shọvel kpasaa nke ọma.
ISA 30:25 Nʼelu ugwu ọbụla dị elu na nʼelu ugwu nta ọbụla dị elu, ka iyi na mmiri niile ga-eru, nʼụbọchị oke ogbugbu, mgbe ụlọ elu niile ga-ada.
ISA 30:26 Ọnwa ga-amụke dịka anwụ, ìhè anyanwụ ga-adịkwa okpukpu asaa dịka ìhè ụbọchị asaa e mere ka ọ mụọ nʼotu ụbọchị! Ihe ndị a ga-emezu nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị malitere ikechi na ịgwọ ọnya o mere ka o rute ndị ya aka.
ISA 30:27 Lee, Aha Onyenwe anyị ka o si nʼebe dị anya na-abịa! Ọ na-abịa nʼoke iwe, anwụrụ ọkụ gbakwara ya gburugburu. Iwe jupụtara nʼegbugbere ọnụ ya, okwu ya na-erechapụ dịka ọkụ.
ISA 30:28 Iku ume ya dịkwa ka iyi rubigara oke, nke na-achị ọkụ, nke na-etoru onye nọ nʼime ya nʼolu. Ọ na-ayọcha mba niile nʼime nyọ ịla nʼiyi, ọ na-etinye nʼagba ndị mmadụ eriri igwe nke na-edufu ha.
ISA 30:29 Ma unu ga-abụ abụ dịka unu na-abụ nʼabalị mmemme dị nsọ, obi unu ga-aṅụrị ọṅụ dịka mgbe ndị na-egbu opi na-arịgo elu na-aga nʼugwu nsọ Onyenwe anyị, na-agakwuru Oke Nkume Izrel.
ISA 30:30 Onyenwe anyị ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube, ọ ga-emekwa ka ha hụ aka ya na-arịdata ala jiri ọnụma nke iwe ya na ọkụ na-erepịa erepịa, jirikwa oke mmiri ozuzo, na egbe eluigwe, na akụmmiri igwe.
ISA 30:31 Olu Onyenwe anyị ga-emenye ndị Asịrịa egwu; ọ ga-eji mkpara igwe ya kụdaa ha nʼala.
ISA 30:32 Ihe otiti ọbụla nke Onyenwe anyị na-eji mkpọ ya, tie ha nʼahụ ga-adị ka egwu ụbọ akwara na une dị iche iche na-enye, mgbe ọ na-eweli aka ya na-eti ha oke ihe otiti dịka ọ na-alụso ha ọgụ.
ISA 30:33 Edoolarị ihe niile nʼusoro site nʼoge gara aga. A kwadoola ebe a ga-akwanye ọkụ nke ga-erechapụ eze ahụ. Ọ bụ ebe sara mbara, nke dị omimi, na nke a kwajuru nkụ. Ọ bụ iku ume Onyenwe anyị nke dịka mwụpụta nke nkume na-enwu ọkụ ka a ga-eji mụnye ya ọkụ.
ISA 31:1 Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka, ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya, ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ, ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya. Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel; ha adịghị arịọkwa ya ka Onyenwe anyị nyere ha aka.
ISA 31:2 Ma ya onwe ya maara ihe, ọ pụrụ iweta ịla nʼiyi. Ọ dịkwaghị agbanwe okwu ya. Ọ ga-ebili megide ndị mba na-eme ihe ọjọọ; ha na ndị niile na-enyere ndị na-eme ajọ ihe aka.
ISA 31:3 Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke! Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ. Mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya imegide ha, ha ga-asọ ngọngọ; ndị ha na-enyere aka ga-adakwa. Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi.
ISA 31:4 Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Dịka ọdụm na-agbọ ụja, na-ebigbọ nʼelu anụ ọ dọgburu, nʼagbanyeghị na-akpọkọtara igwe ndị ọzụzụ atụrụ imegide ya, ọ naghị atụ egwu mkpu ha, mkpọtụ ụzụ ha adịghị enyekwa ya nsogbu, Otu a kwa, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-arịdata ibu agha nʼugwu Zayọn, na nʼugwu nta ya niile.
ISA 31:5 Dịka nnụnụ si efegharị nʼelu akwụ ya ichebe ụmụ ya, otu a ka mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-esi chebe Jerusalem, ọ ga-ekpuchi ya napụta ya, ọ ghaghị ịgabiga ya, gbapụtakwa ya.”
ISA 31:6 Lọghachitenụ azụ, unu bụ Izrel, laghachikwurunụ onye ahụ nke unu nupuru isi nʼebe ọdị ukwuu megide.
ISA 31:7 Amaara m nke ọma na ụbọchị ahụ na-abịa, mgbe onye ọbụla nʼime unu ga-atụfu arụsị ọlaedo na ọlaọcha niile nke aka mmehie unu kpụrụ.
ISA 31:8 “Mgbe ahụ, Asịrịa ga-ada, kama ọ bụghị site na mma agha mmadụ, mma agha na-abụghị nke mmadụ efu ga-erichapụ ha. Ha ga-esi nʼihu mma agha gbaa ọsọ, ma ụmụ okorobịa ha ka a ga-akpụrụ tinye nʼọrụ mmanye.
ISA 31:9 Obodo ha niile e wusiri ike ga-ada nʼihi oke egwu, ndị ọchịagha ha ga-atụkwa ụjọ mgbe ha hụrụ ọkọlọtọ agha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. Onye ọkụ ya dị na Zayọn, onye ekwu igwe ọkụ ya dị na Jerusalem.
ISA 32:1 Lee, eze ga-achị nʼezi omume na-abịa, ya na ndịisi kwesiri ntụkwasị obi, ndị ga-ekpe ikpe ziri ezi.
ISA 32:2 Onye ọbụla nʼime ha ga-aghọrọ ndị mmadụ ebe a na-ezere ndụ nʼoge oke ifufe, na ebe mgbaba nʼoge oke mmiri ozuzo. Ha ga-adị ka mmiri na-asọ nʼọzara, maọbụ dịka ndo nke nkume dị elu na-enye nʼebe okpomọkụ na-eweta ike ọgwụgwụ dị.
ISA 32:3 Mgbe ahụ, agaghị emechikwa anya ndị niile na-ahụ ụzọ, agakwaghị eme ka ntị na-anụ ihe kwụsị ịnụ ihe.
ISA 32:4 Ọ bụladị obi ndị nzuzu nʼetiti ha ga-ejupụta nʼakọnuche na nghọta, ndị ahụ na-asụ nsụ ga-ekwukwa okwu nke ọma.
ISA 32:5 Nʼụbọchị ahụ, a gaghị ahụkwa onye nzuzu sị na ọ bụ onye maara ihe. A gaghị enyekwa onye aghụghọ nsọpụrụ ọzọ.
ISA 32:6 Nʼihi na ndị nzuzu na-ekwu okwu na-echeghị echiche, obi ha niile dị na-ime ajọ ihe. Ọ na-ebi ndụ asọpụrụghị Chineke, na-ekwusakwa okwu njehie megide Onyenwe anyị; ndị agụụ na-agụ ka ha na-agbaba aka ndị akpịrị na-akpọ nkụ, ha adịghị enye ha mmiri ọṅụṅụ.
ISA 32:7 Ndị ọjọọ na-eji ụzọ aghụghọ niile eme ihe ọjọọ, ha na-echepụta nzube ajọ ihe niile, iji okwu ụgha laa onye ogbenye nʼiyi, ọ bụladị mgbe arịrịọ nke onye ahụ nọ na mkpa bụ nke ziri ezi.
ISA 32:8 Ma onye a na-asọpụrụ na-atụpụta atụmatụ dị ezi mma, ọ na-eguzokwa chịm nye ezi ihe.
ISA 32:9 Unu ndị inyom na-ebi ndụ ndị afọ juru, bilie ọtọ, gee m ntị; unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi, nụrụnụ ihe m nwere ikwu.
ISA 32:10 Nʼoge na-adịghị anya, mgbe otu afọ na abalị ole na ole gasịrị, unu bụ ndị nwere ntụkwasị obi ga-ama jijiji; nʼihi na mkpụrụ ubi vaịnị unu ga-emebi, owuwe mkpụrụ ihe ubi agaghị abịa.
ISA 32:11 Maanụ jijiji, unu ndị inyom afọ juru, tụọ egwu unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi. Yipụnụ uwe ọma unu, kekwasịnụ onwe unu akwa mkpe.
ISA 32:12 Tienụ aka nʼobi nʼihi ubi unu na-enye afọ ojuju, nʼihi osisi vaịnị na-amị mkpụrụ.
ISA 32:13 Nʼihi na ogwu na uke ga-epupụta nʼala unu. Ruonụ uju, nʼihi na ụlọ niile unu na-anọ nʼime ya enwe obi ụtọ, na obodo niile unu na-anọ nʼime ya na-eri, na-aṅụ agakwaghị adị.
ISA 32:14 Nʼihi na a ga-ahapụ ebe niile e wusiri ike, gbahapụkwa obodo ahụ ụzụ na-adị nʼime ya; ụlọ elu nche niile na ebe niile ewusiri ike ga-abụ ebe ga-atọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi, ha ga-aghọ ebe ịnyịnya ibu ọhịa ga na-enwe obi ụtọ, na ebe igwe anụ ụlọ ga na-akpa nri ha.
ISA 32:15 Ha niile ga-adịgide otu a tutu ruo mgbe a ga-esite nʼeluigwe wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ. Mgbe ahụ ọzara ga-aghọ ala ubi mara mma, ala ubi ọma ahụ ga-adịkwa ka ọhịa.
ISA 32:16 A ga-emekwa ka ikpe ziri ezi ga-ebi nʼọzara, ezi omume ga-adịkwa nʼubi ọma ahụ.
ISA 32:17 Mkpụrụ nke ezi omume ahụ ga-abụ udo; ihe ga-esikwa na ya pụta ga-abụ ị nọ jụụ na ntụkwasị obi mgbe niile ebighị ebi.
ISA 32:18 Ndị m ga-ebi nʼebe obibi nke udo, nʼụlọ nwere ezi nchekwa, nʼebe izuike nke nsogbu na-adịghị.
ISA 32:19 A sikwa na mkpụrụ mmiri ezoo nʼoke ọhịa niile, a sikwa na e bibie obodo niile,
ISA 32:20 ndị a gọziri agọzi ka unu ga-abụ, mgbe unu na-agha mkpụrụ unu nʼakụkụ iyi, mgbe ehi unu na ịnyịnya ibu unu na-akpagharị na-aga ebe ọbụla ha chọrọ.
ISA 33:1 Ahụhụ dịrị gị, onye mbibi, onye bibiri ihe niile dị gị gburugburu, ma ọ dịbeghị mbibi rutere gị aka. Ahụhụ dịrị gị, onye nrafu, onye na-enwebeghị ndị rafuru gị. Mgbe ị kwụsịrị ibibi ihe ka a ga-ebibi gị, mgbe ị kwụsịkwara nrafu ka a ga-arafu gị.
ISA 33:2 Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ, nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya. Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile, bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa.
ISA 33:3 Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị. Mgbe ị guzoro ọtọ, mba niile na-agbalaga.
ISA 33:4 Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi, otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche.
ISA 33:5 Onyenwe anyị dị elu, nʼihi na o bi nʼebe dị elu. Ọ ga-eji ikpe ya ziri ezi, na ezi omume mejupụta Zayọn.
ISA 33:6 Ọ ga-abụ ntọala guzosiri ike nke oge unu niile, ụlọakụ dị ukwu nke nzọpụta, na amamihe na ihe ọmụma; egwu Onyenwe anyị bụ igodo nke akụ a.
ISA 33:7 Lee ndị ha dị ike ka ha na-eti mkpu akwa nʼokporoụzọ niile; ndị na-anọchite anya ha, ndị bịara ikwu otu udo ga-esi dịrị na-akwa akwa.
ISA 33:8 Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla. E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire. A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe ha mee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike. Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ.
ISA 33:9 Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu. Oke ọhịa Lebanọn akpọnwụọla bụrụ ihe ihere. Sharọn aghọkwaala ọzara; osisi dị na Bashan na nʼelu ugwu Kamel na-agbụchakwa akwụkwọ ha.
ISA 33:10 Ma Onyenwe anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.” “Ugbu a, ka a ga-eme ka m dị elu; ugbu a, ka a ga-ebuli m elu.
ISA 33:11 Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ, unu na-amụpụta ahịhịa, nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu.
ISA 33:12 Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ; ha ga-ere ọkụ dịka avụvụ nkwụ.”
ISA 33:13 Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya! Unu ndị nọ nso, kwerenụ nʼezie na m siri ike!
ISA 33:14 Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu, ha na-akwa akwa na-asị, “Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa, ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?”
ISA 33:15 Ndị na-ejegharị nʼezi omume na-ekwu ihe ziri ezi, ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi, ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche, ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara, na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ.
ISA 33:16 Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu, ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu. A ga-enye ha nri, mmiri a gaghị akọkwa ha.
ISA 33:17 Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya; unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya.
ISA 33:18 Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga. “Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a? Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ? Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?”
ISA 33:19 Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ, bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị, nke unu na-adịghị aghọtakwa.
ISA 33:20 Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile; anya unu ga-ahụkwa Jerusalem, ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ; apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya, maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya.
ISA 33:21 Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-abụrụ anyị Onye dị ike. Ọ ga-adịkwara anyị ka osimiri na iyi dị obosara. Ọ dịghị ụgbọ amara maọbụ ụgbọ ukwu ga-abịa na mmiri ahụ.
ISA 33:22 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ikpe anyị. Onyenwe anyị bụ onye na-enye anyị iwu. Onyenwe anyị bụ eze anyị, ọ bụ ya na-azọpụta anyị.
ISA 33:23 A tọsaala ụdọ niile: Ha adịghị ejidesikwa ọkọlọtọ gị ike, a gbasaghịkwa akwa igbochi ifufe. Mgbe ahụ, a ga-ekesa ụba ihe a kwatara nʼagha ọ bụladị ndị ngwụrọ ga-ebute ihe nkwata nʼagha.
ISA 33:24 Ọ dịkwaghị onye bi na Zayọn ga-asị, “Ahụ esighị m ike,” nʼihi na a ga-agbaghara ndị bi nʼime ya mmehie ha niile.
ISA 34:1 Bịanụ nso, unu ndị mba niile, ṅaa ntị. Geenụ ntị, unu mba niile nke ụwa. Ka ụwa na ihe niile dị nʼime ya, na ihe niile na-esi nʼime ya apụta nụrụ.
ISA 34:2 Nʼihi na Onyenwe anyị na-eweso mba niile nke ụwa iwe, iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile. Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam, nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha.
ISA 34:3 Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ. Ozu ha ga-esikwa isi. Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha.
ISA 34:4 Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze, a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ, kpakpando niile ga-ada dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ, dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ.
ISA 34:5 Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe, lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm, ndị m mara ikpe mbibi.
ISA 34:6 Mma agha Onyenwe anyị jupụtara nʼọbara, abụba kpuchikwara ya, ọbara ụmụ atụrụ na mkpi na abụba sitere nʼakụrụ ebule nʼihi na Onyenwe anyị nwere ịchụ aja na Bozra. O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm.
ISA 34:7 Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa, ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta. Ala ga-ejupụta nʼọbara ha. Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha.
ISA 34:8 Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ. Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn.
ISA 34:9 Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii, uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ), ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii.
ISA 34:10 Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie; anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi. Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ.
ISA 34:11 Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya, ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ. Chineke ga-eseti nʼelu Edọm, eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara, na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu.
ISA 34:12 Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze. Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa.
ISA 34:13 Ogwu ga-etochi ụlọ ukwu ya niile; ebe ya niile e wusiri ike ga-aghọ ahịhịa ogwu, ọ ga-abụkwa ụlọ nkịta ọhịa na nke ikwighịkwighị.
ISA 34:14 Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ. Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa. Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha, chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike.
ISA 34:15 Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ. Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya, lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha. Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa, nke ọbụla na ibe ya.
ISA 34:16 Nyochaa akwụkwọ nsọ ka ị gụọ ihe Onyenwe anyị gaje ime: Ọ dịghị anụ ọhịa ọbụla ga-efu. Ọ dịghị nke ọbụla ga-anọ nʼebe ahụ hapụ ịkpọ ibe ya, nʼihi na ọnụ ya enyela iwu a. Mmụọ ya ga-achịkọtakwa ha.
ISA 34:17 Ọ bụ ya onwe ya ga-ekewa ala ahụ, jiri ihe ọtụtụ nʼaka keere ha oke ahụ. Ha ga-enweta ya ruo mgbe ebighị ebi, nwekwa ebe obibi nʼebe ahụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
ISA 35:1 Nʼụbọchị ahụ, ọzara na ala kpọrọ nkụ ga-enwe obi ụtọ; okoko osisi mara mma ga-awapụtakwa nʼọzara. Dịka rozu,
ISA 35:2 ọ ga-agbawa ifuru jupụta; ọ ga-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu, tiekwa mkpu ọṅụ. A ga-enye ya nsọpụrụ nke ugwu Lebanọn, nyekwa ya ịma mma nke ala ubi Sharọn na Kamel. Ha ga-ahụ ebube Onyenwe anyị nʼebe ahụ, ha ga-ahụkwa ịdị ukwuu nke Chineke anyị.
ISA 35:3 Meenụ ka aka ndị ahụ kụdara akụda dịkwa ike, gbaakwanụ ụkwụ ndị ahụ na-asọ ngọngọ ume.
ISA 35:4 Gwanụ ndị ahụ na-atụ egwu sị ha, “Dịrịnụ ike, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu na-abịa. Ọ ga-abịa ịbọtara unu ọbọ, ịkwụghachi ndị iro unu ihe ruuru ha. Ọ ga-abịa ịzọpụta unu.”
ISA 35:5 Mgbe ọ bịara, ọ ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì, meekwa ka ndị ntị chiri nụ ihe.
ISA 35:6 Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele, meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ. Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara, mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ.
ISA 35:7 Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri. Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta. Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri; ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya.
ISA 35:8 Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ, nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ, Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ. Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya, ndị nzuzu ajọ omume agaghị ejegharị nʼelu ya.
ISA 35:9 Ọdụm agaghị anọ nso ụzọ ahụ. Ọ dịkwaghị anụ ọhịa na-egbu mmadụ ga-aga nʼelu ya. E, agaghị ahụ anụ dị otu a nʼebe ahụ. Kama, ọ bụ naanị ndị a gbapụtara ga-eje ije na ya.
ISA 35:10 Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha. Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha. Iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.
ISA 36:1 Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib, bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, meriekwa ha.
ISA 36:2 Mgbe ahụ, eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha ya, ya na usuu ndị agha ijekwuru Hezekaya na Jerusalem. Mgbe ọchịagha ahụ kwụsịrị nʼụzọ mmiri nke ọdọ mmiri dị Elu, nʼụzọ jere nʼebe ọhịa Ọsụ akwa.
ISA 36:3 Eliakịm, nwa Hilkaya, onye nlekọta ụlọeze, na Shebna, bụ ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ya.
ISA 36:4 Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ Hezekaya: “ ‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa, na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere?
ISA 36:5 Ị na-ekwu na i nwere ndụmọdụ na ike ibu agha, maọbụ naanị egbe ọnụ ka ị na-agba. Ọ bụ onye ka ị na-atụkwasị obi, mere i ji enupu isi nʼokpuru m?
ISA 36:6 Lee, amatara m na ị na-atụkwasị obi nʼIjipt, mkpanaka achara ahụ gbajiri agbaji, nke na-adụwa aka onye ọbụla na-adabere na ya. Otu a ka Fero, eze Ijipt dị nye ndị niile na-atụkwasị ya obi.
ISA 36:7 Ma ọ bụrụ na unu asị m, “Anyị na-atụkwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị obi.” Ọ bụghị ya ka Hezekaya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, “Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼebe ịchụ aja a?”
ISA 36:8 “ ‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha.
ISA 36:9 Ị ga-esi kwa aṅaa jụ otu onyeisi nke dịkarịsịrị nta nʼime ndịisi ọrụ onyenwe m, na-agbanyeghịkwa na i na-atụkwasị obi nʼIjipt maka inweta ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya?
ISA 36:10 Tinyere nke a, abịara m ibuso ala a agha na ibibi ya ma ọ bụghị nkwado Onyenwe anyị? Onyenwe anyị ya onwe ya gwara m ka m bilie megide obodo a, lakwaa ya nʼiyi.’ ”
ISA 36:11 Mgbe ahụ Eliakịm, Shebna na Joa sịrị ọchịagha ahụ, “Biko, gwa ndị ohu gị okwu nʼasụsụ Aramaik, ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ya. Agwala anyị okwu nʼasụsụ Hibru, ebe ndị nọ nʼelu mgbidi ga-anụ.”
ISA 36:12 Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?”
ISA 36:13 Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu niile nke eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa.
ISA 36:14 Nke a bụ ihe eze sịrị, Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu.
ISA 36:15 Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Onyenwe anyị obi, mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, Onyenwe anyị aghaghị ịnapụta anyị. A gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’
ISA 36:16 “Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya:
ISA 36:17 ruo mgbe m ga-abịa duru unu gaa nʼala dịka nke unu, bụ ala mkpụrụ ọka na nke mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịnị jupụtara nʼime ya.
ISA 36:18 “Unu ekwela ka Hezekaya rafuo unu mgbe ọ na-asị, ‘Onyenwe anyị ga-anapụta anyị.’ O nweela chi niile nke ndị mba ọzọ, nke napụtarala ala ha site nʼaka eze Asịrịa.
ISA 36:19 Olee ebe ka chi ndị Hamat na Apad nọ? Olee ebe ka chi ndị Sefavaim nọkwa? Ha anapụtala Sameria site nʼaka m?
ISA 36:20 Olee chi nʼime chi mba ndị a niile, bụ ndị zọpụtarala ala ha site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na Onyenwe anyị pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?”
ISA 36:21 Ma ndị ahụ niile gbara nkịtị, ha ekwughị ihe ọbụla, nʼihi na eze nyere ha iwu sị, “Unu azaghachila ya.”
ISA 36:22 Mgbe Eliakịm nwa Hilkaya, onyeisi ọchịchị, na Shebna ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, ode akwụkwọ akụkọ eze laghachikwuuru Hezekaya, ha dọwara uwe ha mgbe ha na-aga igosi ya ịda mba nke obi ha. Ha gwakwara ya ihe niile onyeisi agha ndị Asịrịa kwuru.
ISA 37:1 Mgbe eze Hezekaya nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
ISA 37:2 O zipụrụ Eliakịm, onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz.
ISA 37:3 Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya.
ISA 37:4 Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ nke Rabashaka, bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.”
ISA 37:5 Mgbe ndị ọrụ eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya,
ISA 37:6 ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m.
ISA 37:7 Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ”
ISA 37:8 Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha.
ISA 37:9 Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Mgbe ọ nụrụ nke a, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị,
ISA 37:10 “Gwanụ Hezekaya, eze Juda: Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’
ISA 37:11 Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị?
ISA 37:12 Chi niile nke mba niile, ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden ndị nọ na Tel Asa?
ISA 37:13 Olee ebe eze ndị Hamat maọbụ eze ndị Apad nọ? Olee ebe eze obodo Lair, Sefavaim, Hena na Iva nọkwa?”
ISA 37:14 Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị.
ISA 37:15 Hezekaya kpere ekpere nye Onyenwe anyị, sị:
ISA 37:16 “O, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa.
ISA 37:17 Tọọ ntị gị nʼala, o Onyenwe anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ Onyenwe anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu niile ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ.
ISA 37:18 “Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala ndị a niile na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu,
ISA 37:19 ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa.
ISA 37:20 Ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị bụ Chineke, na ọ dịkwaghị chi ọzọ ma ọ bụghị gị.”
ISA 37:21 Mgbe ahụ, Aịzaya nwa Emọz, zigaara Hezekaya ozi, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sịrị, Nʼihi ekpere gị niile nye m banyere Senakerib, eze Asịrịa,
ISA 37:22 nke a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru megide ya. “Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Zayọn, na-elelị gị anya, jirikwa gị na-eme ihe ọchị, Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ.
ISA 37:23 Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide onye Nsọ nke Izrel?
ISA 37:24 I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, ‘Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ ya kachasị nʼịdị elu, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.
ISA 37:25 Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.’
ISA 37:26 “Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka nọ pịa ọpịpịa ya, ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.
ISA 37:27 Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere, bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi, na ome na-epupụta epupụta, nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.
ISA 37:28 “Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ, marakwa ọpụpụ gị na mbata gị, marakwa oke iwe gị megide m.
ISA 37:29 Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị, werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị, mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.
ISA 37:30 “Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama nye gị, Hezekaya. “Nʼafọ a, unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi, kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.
ISA 37:31 Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.
ISA 37:32 Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta, otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezu nke a.
ISA 37:33 “Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa. “Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a. Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya, maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya.
ISA 37:34 Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi; ọ gaghị abanye nʼobodo a.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
ISA 37:35 “Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.”
ISA 37:36 Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile.
ISA 37:37 Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa, biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive.
ISA 37:38 Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
ISA 38:1 Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”
ISA 38:2 Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị sị,
ISA 38:3 “Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.
ISA 38:4 Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere Aịzaya,
ISA 38:5 “Gaa, gwa Hezekaya, sị ‘Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nna gị Devid kwuru, anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị.
ISA 38:6 Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a.
ISA 38:7 “ ‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa.
ISA 38:8 Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’ ” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri.
ISA 38:9 Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike:
ISA 38:10 Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa ka m ga-agabiga nʼọnụ ụzọ nke ọnwụ, bụrụ onye anapụrụ oge ndụ m nke fọdụrụ afọdụ?”
ISA 38:11 Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ nʼala ndị dị ndụ, m gaghị elegidekwa mmadụ ibe m anya ọzọ, maọbụ bie nʼetiti ndị bi nʼime ụwa a.
ISA 38:12 Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ. Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa o bipụla ndụ site nkwe-akwa, ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa.
ISA 38:13 Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ. Ma dịka ọdụm ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile. Ehihie na nʼabalị ka ị na-eme ka ndụ m gwụsịa.
ISA 38:14 Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa. Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ. Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe. Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.”
ISA 38:15 Ma gịnị ka m ga-ekwu? Ya onwe ya gwara m sị na ọ bụ ya mere nke a. M ga-eji obi umeala gagharịa ụbọchị ndụ m niile nʼihi ihe mwute nke obi m.
ISA 38:16 Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ. Mmụọ m na-adịkwa ndụ nʼime ha. I nyeghachila m ahụ ike, mee ka m dị ndụ.
ISA 38:17 Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m, ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a. Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara m site nʼolulu nke ịla nʼiyi. I werela mmehie m niile wefee nʼazụ gị.
ISA 38:18 Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị, ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto. Ndị na-arịda nʼolulu agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị.
ISA 38:19 Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto, dị ka m na-eme taa. Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.
ISA 38:20 Onyenwe anyị ga-azọpụta m, anyị ga-abụ abụ kpọọ ụbọ akwara nʼụbọchị niile nke ndụ anyị, nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
ISA 38:21 Aịzaya ekwuolarị sị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ tee ya nʼelu etuto ahụ, ahụ ga-adịkwa ya mma.”
ISA 38:22 Hezekaya jụrụ sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?”
ISA 39:1 Nʼoge ahụ, Merodak-Baladan, nwa Baladan, bụ eze Babilọn zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi ekele na onyinye, nʼihi na ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa ma nwe ahụ ike.
ISA 39:2 Hezekaya nabatara ndị ozi ahụ nke ọma gosi ha ihe ndị dị nʼụlọakụ ya, ọlaọcha, na ọlaedo, ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ, ezigbo mmanụ oliv, ụlọ niile ebe ngwa agha ya niile dị, na ihe niile bụ akụ o nwere. Ọ dịghị ihe dị nʼụlọeze ya maọbụ nʼalaeze ya niile nke ọ na-egosighị ha.
ISA 39:3 Mgbe ahụ, Aịzaya onye amụma jekwuru eze Hezekaya jụọ ya sị, “Gịnị ka ndị ikom ndị ahụ kwuru? Ebeekwa ka ha si bịakwute gị?” Hezekaya zara sị, “Ọ bụ nʼala dị anya ka ha si bịakwute m, ha si Babilọn.”
ISA 39:4 Onye amụma jụrụ, “Gịnị ka ha hụrụ nʼụlọ gị?” Hezekaya zara sị, “Ihe niile nke dị nʼụlọ m ka ha hụrụ. Ọ dịghị ihe niile dị nʼụlọakụ m nke m na-egosighị ha.”
ISA 39:5 Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị Hezekaya, “Gee ntị nụrụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
ISA 39:6 Lee, oge na-abịa mgbe a ga-eburu ihe niile dị nʼụlọeze gị, na ihe niile nke nna nna gị ha debere nʼụlọakụ ruo taa, buru ha bulaa Babilọn. Ọ dịkwaghị ihe ga-afọdụ, otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
ISA 39:7 A ga-ebupụ ụfọdụ nʼime ụmụ gị, ndị bụ ahụ na ọbara gị, ndị a ga-amụtara gị, buru ha pụọ nʼebe dị anya, ha ga-abụ ndị onozi nʼụlọeze nke eze Babilọn.”
ISA 39:8 Hezekaya zaghachiri, “Okwu Onyenwe anyị nke i kwuru dị mma.” Nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Udo na nchekwa ga-adị nʼoge ndụ m.”
ISA 40:1 Kasịenụ ndị m obi, kasịenụ ha obi, ka Chineke gị kwuru.
ISA 40:2 Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu, gwa ya; na ụbọchị ọjọọ ya niile agwụla, na a kwụzuola ụgwọ mmehie ya niile, na o sitela nʼaka Onyenwe anyị nata ụgwọ ọrụ karịrị okpukpu abụọ nke mmehie ya niile.
ISA 40:3 Otu onye na-eti mkpu sị, “Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị nʼime ọzara, meenụ ka ụzọ atụliri atụli guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị.
ISA 40:4 A ga-eme ka ndagwurugwu ọbụla dị elu, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala, ebe niile dị mkputamkpu ka a ga-eme ka o guzo kwem, meekwa ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị.
ISA 40:5 Nʼihi na a ga-ekpughepụ ebube Onyenwe anyị, mmadụ niile ga-ahụkọkwa ya nʼotu. Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.”
ISA 40:6 Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!” Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?” “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa.
ISA 40:7 Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ, nʼihi nʼokuku ume nke Onyenwe anyị na-ekukwasị ya. Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ.
ISA 40:8 E, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko na-achanwụkwa, ma okwu Chineke anyị na-eguzogide ruo mgbe ebighị ebi.”
ISA 40:9 Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn, rigoro nʼelu ugwu; gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem, welie olu gị elu tisie mkpu ike; e, tisie mkpu ike, atụla egwu. Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha: “Chineke unu na-abịa.”
ISA 40:10 Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike, ike aka ya ka o ji achị. Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ.
ISA 40:11 Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ. Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.
ISA 40:12 Onye jirila ọbụ aka ya tụọ mmiri dị nʼoke osimiri? Maọbụ onye jiri ntu-aka ya tụọ mbara eluigwe? Onye ka ọ bụ jirila nkata kute uzuzu? Maọbụ jiri ihe ọtụtụ tụọ ugwu ukwu? Onye kwa ji ihe ọtụtụ tụọ ugwu nta?
ISA 40:13 Onye nwere ike ịghọta Mmụọ nke Onyenwe anyị, maọbụ dịka onye ndụmọdụ Onyenwe anyị na-ezi ya ihe?
ISA 40:14 Ọ bụ onye ka Onyenwe anyị gakwuru gbaa izu ka ọ kọwaara ya ihe, ọ bụ onye ziri ya ụzọ bụ nke dị mma? Onye bụ onye ahụ kuziri ya ihe ọmụma, maọbụ gosi ya ụzọ nke nghọta?
ISA 40:15 Nʼezie, mba niile dị iche iche dịka otu ntupụta mmiri tanyere nʼime efere; a na-agụnye ha dịka uzuzu dị nʼelu ihe ọtụtụ e ji atụ ihe; ọ na-atụ ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu dịka a ga-asị na ha bụ uzuzu ọma na-adịghị arọ.
ISA 40:16 Osisi niile dị na Lebanọn ezughị iji kwanye ọkụ e ji a chụrụ Chineke anyị aja. Otu a kwa, anụmanụ niile dị nʼọhịa Lebanọn niile erughị iji chụọrọ Chineke anyị aja.
ISA 40:17 O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya; ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru, dịka ihe na-erughị ihe efu.
ISA 40:18 Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke? Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri?
ISA 40:19 Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ, nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya, ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha.
ISA 40:20 Ma onye ogbenye na-enweghị ịchụ aja dị otu a na-ahọrọ osisi nke na-agaghị ere ure. Ọ na-akpọtara onwe ya onye maara akwa ǹka osisi nke ọma, onye ga-apịtara ya oyiyi arụsị nke na-agaghị ada ada.
ISA 40:21 Ọ bụ na unu amaghị? Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya? Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite? Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa?
ISA 40:22 Na Chineke nọ nʼelu ocheeze ya nke gbara ụwa gburugburu. Ndị nọ nʼụwa dịkwa ka ụmụ ụkpana. Ọ bụ ya tụsara eluigwe dịka akwa, were ya mere ebe obibi ya.
ISA 40:23 Ọ na-eweda ndị ukwu niile nke ụwa, mee ha ka ha ghọọ ihe efu.
ISA 40:24 Mgbe a na-ele ha anya, ha na-adị ka ihe a kụrụ nʼubi nke na-epute epute. Mgbe a kụrụ ha, mgbe ha na-epute, mgbe ha na-amanye mgbọrọgwụ nʼala, mgbe ahụ kwa ka Onyenwe anyị na-ezite ifufe nke na-akpọnwụ ha, bufuo ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
ISA 40:25 “Olee onye unu ga-eji tụnyere m? Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ.
ISA 40:26 Lee anya nʼeluigwe; onye kere kpakpando ndị a niile? Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ? Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya? Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu, ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu.
ISA 40:27 Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb? Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị, “Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị, Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?”
ISA 40:28 Ọ bụ na ị matabeghị? Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi, Onye kere nsọtụ niile nke ụwa. Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya. O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.
ISA 40:29 Ọ na-enye ndị na-ada mba ike, na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume.
ISA 40:30 Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha. E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa,
ISA 40:31 ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
ISA 41:1 Nọrọnụ jụụ nʼihu m, unu mba niile mmiri gbara gburugburu! Ka mba niile gbanwee ike ha. Ka ha pụta kwuo okwu. Ka anyị zukọtaa nʼebe ikpe ikpe.
ISA 41:2 “Onye kpọtere onye a sitere nʼọwụwa anyanwụ na-abịa, onye e sitere nʼezi omume kpọọ ya ije ozi? O weere mba niile nyefee ya nʼaka, meriekwa ndị eze nʼihu ya. O ji mma agha ya tie ha mee ka ha ghọọ uzuzu, jiri ụta ya mee ka ha ghọọkwa igbugbo ọka nke ifufe na-ebugharị.
ISA 41:3 Ọ na-achụ ha ọsọ, ma na-agakwa nʼihu na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla. E, ọ na-agbasokwa ụzọ nke ọ na-agabeghị mbụ.
ISA 41:4 Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya, na-akpọ ọgbọ niile site na mmalite? Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, onye dị siterị na mbido ihe niile, onye ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe niile. Ọ bụ mụ onwe m bụ onye ahụ.”
ISA 41:5 Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu; ndị niile bi na nsọtụ ụwa na-amakwa jijiji. Ha zukọtara bịa nso.
ISA 41:6 Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị, “Nwee obi ike.”
ISA 41:7 Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume. Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ, na-agba onye na-akụ osiama ume. Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.” Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda.
ISA 41:8 “Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m, Jekọb, onye m họpụtara, gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m.
ISA 41:9 Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu, gwa unu na ohu m ka unu bụ, nʼihi na ahọpụtala m unu, agakwaghị m ahapụ unu.
ISA 41:10 Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.
ISA 41:11 “Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere, ihere ga-emekwa ha. Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu, bụrụ ndị lara nʼiyi.
ISA 41:12 Unu ga-ele anya ha, chọọ ha, ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ. Ndị a na-ebuso unu agha ga-abụ naanị ihe efu.
ISA 41:13 Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ejidesi aka nri gị ike bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu; aga m enyere gị aka.’
ISA 41:14 Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb, unu Izrel dị nta, atụla egwu, nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel.
ISA 41:15 “Lee, aga m eme ka unu ghọọ igwe ọhụrụ eji azọcha mkpụrụ ọka nke dị nkọ, nwekwa ọtụtụ eze. Unu ga-azọcha ugwu niile zọpịa ha, meekwa ka ugwu nta niile dịka igbugbo ọka.
ISA 41:16 Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo, oke ikuku ga-ekposasị ha. Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel.
ISA 41:17 “Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa, mgbe ha na-enweghị ike ịchọta mmiri ọṅụṅụ mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ nʼihi agụụ mmiri, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza ha. Mụ onwe m, bụ Chineke nke Izrel, agaghị agbakụta ha azụ.
ISA 41:18 Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha. Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile. Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta.
ISA 41:19 Aga m akụ nʼọzara, osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv. M ga-eji osisi junipa, na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu,
ISA 41:20 ka ndị mmadụ hụ, matakwa, tuleekwa uche ma ghọta, na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a, na ọ bụ Onye nsọ nke Izrel kere ya.
ISA 41:21 “Wepụtanụ mkpesa unu,” ka Onyenwe anyị sịrị, “Doo okwu unu nʼusoro,” ka Eze nke Jekọb na-asịkwa.
ISA 41:22 “Ka ha bubata arụsị ndị a, ma gwa anyị, ihe gaje ime. Ka ha gwa anyị ihe mere nʼoge gara aga, ihe ha pụtara, ka anyị nwee ike tulee ha matakwa ihe ga-abụ ikpeazụ ha. Maọbụ kwupụtara anyị ihe ndị ahụ na-abịa,
ISA 41:23 gwa anyị ihe ọdịnihu ji, ka anyị mara na unu bụ chi. Meenụ ezi ihe, maọbụ ihe ọjọọ, nke ga-eme ka anya gbagwojuo anyị, ka anyị jupụtakwa nʼegwu.
ISA 41:24 Ma unu dị nta karịa ihe efu. Ọrụ unu niile bụkwa ihe na-abaghị uru. Onye họọrọ unu emeela onwe ya ihe arụ.
ISA 41:25 “Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa. Otu onye na-asọpụrụ aha m sikwa nʼọwụwa anyanwụ. Ọ na-azọpịa ndị ọchịchị niile dịka ha bụ ụrọ, ọ ga-azọpịa ha dịka onye na-akpụ ite si azọpịa aja ụrọ.
ISA 41:26 O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara, maọbụ mgbe na o mebeghị, ka anyị nwee ike sị, ‘Ihe o kwuru ziri ezi’? O nweghị onye kwuru ihe banyere nke a, o nweghịkwa onye mere ka amata ya, o nwekwaghị onye si nʼọnụ gị nụ okwu ọbụla.
ISA 41:27 Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’ Ọ bụ m ziteere Jerusalem onyeozi oziọma.
ISA 41:28 Elegharịrị m anya ma o nweghị onye m hụrụ. O nweghị onye nọ nʼetiti chi ha nke nwere ike inye ndụmọdụ; o nweghị onye inye ọsịsa ajụjụ mgbe m jụrụ ha.
ISA 41:29 Lee, ha niile bụ ụgha! Ọrụ ha niile pụtara ihe efu, arụsị ha niile awuru awu bụ naanị ifufe na ọgbaaghara.
ISA 42:1 “Lee ohu m, onye m na-agba ume, onye m họpụtara, onye ihe ya na-atọ mkpụrụobi m ụtọ. Aga m eme ka Mmụọ m dịrị nʼime ya. Ọ ga-emekwa ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka.
ISA 42:2 Ọ gaghị eti mkpu maọbụ welie olu ya kwaa akwa, maọbụ welie olu ya elu, ọ gaghị eme ka a nụ olu ya nʼezi.
ISA 42:3 Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara azọpịa, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị. Ọ ga-esite nʼikwesị ntụkwasị obi wepụta ikpe ziri ezi.
ISA 42:4 Ọ gaghị asọ ngọngọ maọbụ daa mba, ruo mgbe o hiwere ikpe ziri ezi nʼelu ụwa. Ọ bụkwa nʼozizi ya ka agwa etiti niile ga-atụkwasị olileanya ha.”
ISA 42:5 Nke a bụ ihe Chineke bụ Onyenwe anyị kwuru, onye ahụ kere eluigwe niile, onye gbasapụkwara ha, onye gbasapụkwara ụwa nʼihe niile nke si nʼime ya apụta, onye na-enye ndị niile bi nʼime ya ume, na-enyekwa ndị na-agagharị nʼime ya ndụ.
ISA 42:6 “Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, akpọla gị ka i gosi ezi omume m. Aga m echebe gị, gbaa gị ume, nʼihi na eweere m gị nye ndị m ka ị bụrụ ihe imesi ọgbụgba ndụ m ike. Ị ga-abụkwa ìhè nye mba niile.
ISA 42:7 Ị ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì, gbapụtakwa ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, meekwa ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị nwere onwe ha.
ISA 42:8 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị! Nke a bụkwa aha m. Agaghị m enye onye ọzọ ugwu na nsọpụrụ m. Mụ na arụsị a pịrị apị agakwaghị azọ otuto m.
ISA 42:9 Lee ihe ochie emezuola ma nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta. Tupu ha pụta ìhè ana m akpọsa ha nye unu.”
ISA 42:10 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ; tookwanụ ya, unu ndị niile bi na nsọtụ niile nke ụwa, unu ndị na-arịda nʼosimiri, na ihe niile bi nʼime ya. Toonu ya unu ndị bi nʼala ebe mmiri gbara gburugburu.
ISA 42:11 Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu, ka ndị bi na Keda ṅụrịa ọṅụ. Ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ, ka ha si nʼelu ugwu niile tisie mkpu ọṅụ ike.
ISA 42:12 Ka ha nye Onyenwe anyị ebube, kpọsaakwa otuto ya nʼala niile mmiri gbara gburugburu.
ISA 42:13 Onyenwe anyị ga-apụta buo agha dịka dike. Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke onye agha ka ọ ga-eji buo agha. Ọ ga-eti mkpu agha megide ndị iro ya, ma merie ha.
ISA 42:14 “Ọ dịla anya kemgbe m gbara nkịtị; ejidesịrị m onwe m aka ike. Ma ugbu a, aga m egosi iwe m; aga m asụ ude, kwaa akwa dị ka nwanyị ime na-eme.
ISA 42:15 Aga m eme ka ugwu ukwu na ugwu nta niile dị larịị, meekwa ka ihe ọkụkụ ha niile kpọnwụọ. Aga m eme ka osimiri ghọọ ọzara, meekwa ka ọdọ mmiri niile takpọọ.
ISA 42:16 Aga m edu ndị kpuru ìsì, site nʼụzọ nke ha na-amaghị, nʼokporoụzọ ha agatụbeghị ka m ga-edu ha; Aga m eme ka ọchịchịrị ghọọ ìhè nʼihu ha, meekwa ka ebe niile gbagọrọ agbagọ guzozie. Ihe ndị a niile ka m ga-eme. Agaghị m agbakụta ha azụ.
ISA 42:17 Ma ndị niile na-atụkwasị arụsị obi, ndị na-asị ihe ndị ahụ a pịrị apị, ‘Unu bụ chi anyị,’ a ga-achụghachi ha azụ nʼọnọdụ ihere.
ISA 42:18 “Geenụ ntị, unu ndị ntị chiri, leenụ anya unu ndị ìsì kpuru, ma hụ ụzọ.
ISA 42:19 Olee onye kpuru ìsì dịka ohu m? Onye kwa ka ntị chiri dịka onyeozi nke eziokwu m? Ọ dị onye ọzọ kpuru ìsì dịka onye a m họpụtara ka ọ bụrụ ohu Onyenwe anyị?
ISA 42:20 Ị hụla ọtụtụ ihe, ma ị dịghị atụkwasị uche gị na ha. Ntị gị ghere oghe, ma ị dịghị eji ya anụ ihe.”
ISA 42:21 Onyenwe anyị emeela ka iwu ya dị ukwuu, meekwa ka ọ dị ebube, nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ isite na ya mee ka ezi omume ya pụta ìhè.
ISA 42:22 Ma e meela ka ndị ya bụrụ ndị e zukpọrọ ihe ha nwere nʼoge agha. A kpọchikwara ha nʼolulu e gwuru nʼala, zoo ha nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ha aghọọla ihe a kwatara nʼagha, ma ọ dịghị onye na-anapụta ha. Ha aghọkwaala ihe e si nʼaka mmadụ pụnara ya nʼike, ma ọ dịghị onye na-asị ndị iro ha, “Nyeghachikwa m ihe m i ji aka ike were.”
ISA 42:23 Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a? Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu?
ISA 42:24 Onye weere Jekọb nyefee nʼaka ndị na-ebibi ihe, onye were Izrel nyefee ndị ohi? Ọ bụ na ọ bụghị Onyenwe anyị onye ha mehiere megide? Nʼihi na ha ekweghị eso ụzọ ya niile, ha erubeghị isi nye iwu ya.
ISA 42:25 Ọ bụ ya mere o ji wụkwasị ndị ya iwe ọkụ ya, ihe ike nke agha. Ọ bụ ezie na iwe ya bịakwasịrị ha dịka ọkụ na-erepịa erepịa, ma ha aghọtaghị ihe kpatara ya; o repịara ha, ma ha atụgharịa uche ha banyere ya.
ISA 43:1 Ma ugbu a, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, bụ onye kere gị, Jekọb, na onye kpụrụ gị Izrel, “Atụla egwu, nʼihi na agbapụtala m gị. Akpọọla m gị aha, ị bụkwa nke m.
ISA 43:2 Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe, aga m anọnyere gị. Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo, agaghị m ekwe ka o bufuo gị. Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ, ọ gaghị eregbu gị. Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị.
ISA 43:3 Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, Onye nzọpụta gị, na Onye nsọ nke Izrel. Ewerela m Ijipt na Kush na Seba nye ka ha bụrụ ihe i ji gbara onwe gị.
ISA 43:4 Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m, ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya, aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị. Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ.
ISA 43:5 Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị. Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ chịkọtaa ụmụ gị.
ISA 43:6 Aga m enyekwa ugwu na ndịda iwu sị ha, ‘Hapụnụ ha ka ha laa, unu egbochikwala ha.’ Hapụnụ ndị m ka ha site nʼala niile dị anya nke nsọtụ ụwa lọghachi,
ISA 43:7 onye ọbụla nke a na-akpọ aha m, onye m kere nʼihi otuto m, onye m kpụrụ, ma meekwa.”
ISA 43:8 Kpọpụtanụ ha, bụ ndị ahụ nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ, ndị nwere ntị ma ha adịghịkwa anụ ihe.
ISA 43:9 Mba niile dị iche iche ezukọtala, mmadụ niile agbakọtakwala. Onye nʼime chi ha kwuru na ihe dị otu a ga-eme, onye kwa kwuru ihe ndị a mere nʼoge gara aga? Ka ha kpọbata ndị akaebe ha izipụta na ihe ha kwuru ziri ezi, ka ndị ọzọ nụ ya ma sị na, “Ọ bụ eziokwu.”
ISA 43:10 “Unu bụ ndị akaebe m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụrụkwa ndị ohu m họpụtara, ka unu mara m, ma kwerekwa na m, ghọtakwa na Mụ onwe m bụ onye ahụ. Ọ dịghị chi a kpụrụ tupu m dịrị, ọ dịkwaghị nke ga-eso m nʼazụ.
ISA 43:11 Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ Onyenwe anyị, ọ dịkwaghị onye nzọpụta ọzọ dị ma ewezuga m.
ISA 43:12 Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị chi ndị mba ọzọ nọ nʼetiti unu. Unu bụkwa ndị akaebe m, na mụ onwe bụ Chineke,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
ISA 43:13 “E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke. Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m ihe m ji nʼaka. Mgbe m rụrụ ọrụ, onye pụrụ ịgbanwe ya?”
ISA 43:14 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta unu na Onye nsọ nke Izrel. “Nʼihi unu, aga m eziga ozi na Babilọn budata ndị Kaldịa niile dịka ndị gbapụrụ agbapụ, nʼime ụgbọ mmiri ahụ niile ha ji anya isi.
ISA 43:15 Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Onye nsọ gị, onye kere Izrel, Eze unu.”
ISA 43:16 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, bụ onye ahụ kwara ụzọ nʼime osimiri, nke mere ka okporoụzọ dịrị nʼime oke osimiri.
ISA 43:17 Nke na-eme ka ụgbọ ndị agha dị ukwuu, na ịnyịnya pụta, ndị agha na ụsụ ha achịkọtara ọnụ, mee ha ka ha dinaa nʼebe ahụ, ghara ibilitekwa ọzọ, dịka ha bụ ọkụ ogho oriọna e menyụrụ emenyụ.
ISA 43:18 “Chefuonu ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga; unu atụgharịkwala uche unu na ha.
ISA 43:19 Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime. Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya? Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara, na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu.
ISA 43:20 Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m, nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m, nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu, nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara.
ISA 43:21 Ndị m kpụrụ nye onwe m, ka ha kọsaa akụkọ otuto m.
ISA 43:22 “Ma unu akpọkughị m, Jekọb, kama ihe banyere m agwụla gị ike, Izrel.
ISA 43:23 I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ, maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m. O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka, maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ.
ISA 43:24 Unu ewetabereghị m ụda kalamus na-esi isi ụtọ, maọbụ were abụba anụ nke aja unu niile mee ka obi tọọ m ụtọ. Kama ọ bụ naanị mmehie unu ka unu na-ebokwasị m, unu ejirila ajọ omume unu mee ka ike gwụsịa m.
ISA 43:25 “Mụ onwe m, ọ bụ naanị mụ onwe m, bụ onye na-ehichapụ mmehie unu. Ana m emekwa ya nʼihi na ọ dị m mma nʼobi ime ya. Agakwaghị m echeta mmehie unu ọzọ.
ISA 43:26 Chetara m ihe gara aga, ka anyị rụrịta ụka nʼetiti onwe anyị, doo okwu gị nʼusoro igosi na ị bụ onye ikpe na-amaghị.
ISA 43:27 Site na mmalite, nna nna unu ha mehiere megide m. Ndị m dunyere ka ha kuziere unu ihe nupukwara isi megide m.
ISA 43:28 Ya mere, m ji menye ndị a maara aha ha nʼụlọnsọ ihere. Enyefere m Jekọb ka ọ bụrụ onye ewezugara nye mbibi, nyekwa Izrel ka ọ bụrụ ihe mkparị.
ISA 44:1 “Ma ugbu a, gee ntị gị Jekọb, bụ ohu m, geekwanụ ntị, unu ndị Izrel m họpụtara.
ISA 44:2 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ, na onye ga-enyere unu aka: Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara.
ISA 44:3 Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri, mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ. Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m, meekwa ka ngọzị m dịrị ha.
ISA 44:4 Ha ga-etopụta etopụta dịka ahịhịa a gbara mmiri, e, dịka osisi pọpla nʼakụkụ iyi jupụtara na mmiri.
ISA 44:5 Ha ga-eji nganga sị, ‘Abụ m nke Onyenwe anyị,’ maọbụ ‘Abụ m nwa nwa Jekọb,’ ebe ndị ọzọ ga-edepụta nʼaka ha, ‘Nke Onyenwe anyị ka m bụ,’ ha ga-agụkwa onwe ha Izrel.
ISA 44:6 “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, onye bụ Eze Izrel na Onye mgbapụta ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile: Mụ onwe bụ Mmalite na Ọgwụgwụ; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ewezuga m.
ISA 44:7 Ọ bụkwa onye dị ka m? Ya kwupụta ya. Ya kwupụta ya, doo ya nʼusoro ka ntị nụrụ! Ya kwupụta ihe niile mere kemgbe m mere ka ndị m guzosie ike. Ya kwupụtakwa, ma dokwaa ha nʼusoro, ihe niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu.
ISA 44:8 Unu atụla egwu. Unu amakwala jijiji. Ọ bụ na m akọpụtaghị ihe ndị a ma kwupụta ha nʼoge gara aga. Unu onwe unu bụ ndị akaebe m. Ọ dị chi ọzọ dị ma e wezuga m? Mba! O nweghị Oke nkume ọzọ dị, nke m maara ihe banyere ya.”
ISA 44:9 Ndị a niile na-apị arụsị bụ ndị nzuzu. Chi ndị ahụ niile ha na-agụ dị ka ihe ukwu bụkwa ihe na-enweghị isi. Ndị niile na-akpọ isiala nye chi ndị a bụ ndị kpuru ìsì, na ndị amamihe kọrọ, ndị ihere ga-emekwa.
ISA 44:10 Ọ baghị uru mmadụ ịkpụrụ onwe ya arụsị maọbụ chi a pịrị apị, nke na-apụghị inyere ya aka nʼụzọ ọbụla?
ISA 44:11 Lee ihere ga-eme ndị niile na-akpọ isiala nye ya. Ndị kpụrụ ha bụ naanị ndị mmadụ. Ka ha niile chịkọta onwe ha, guzo, nwee mkpebi ha, ha ga-anọ nʼọnọdụ nʼihere, na nʼoke egwu.
ISA 44:12 Ọkpụ ụzụ na-ewere ngwa ọrụ ya na-ahụ ya nʼime icheku ọkụ, ọ na-eji mkpirisi igwe onye ọka tipịa ya nʼụdịdị arụsị, ọ bụ ike nke ogwe aka ya ka o ji akpụ ụzụ. Agụ na-agụ ya, ike na-agwụsịkwa ya; ọ ṅụghị mmiri ọbụla, ọ na-adakwa mba.
ISA 44:13 Onye ọka osisi na-esite nʼeriri ọtụtụ tụpụta osisi were pensụlụ kaa ya; ọ na-ewere ngwa ọrụ ya kpụchaa osisi ahụ, were ngwa ọrụ ịka akara, kaa ya akara. Ọ na-arụ ya dịka oyiyi mmadụ, oyiyi mmadụ nʼịma mma ya niile, maka ibi nʼime ụlọ arụsị.
ISA 44:14 Ọ na-egbutu osisi sida dị iche iche, maọbụ osisi saipres ma ọ bụkwa osisi ook. Ọ na-ahapụ ya ka o too nʼetiti osisi dị iche iche nke oke ọhịa, maọbụ kụọ osisi fịa, nke mmiri ozuzo na-eme ka o too nke ọma.
ISA 44:15 Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere; ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ, ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha. Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya; ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya.
ISA 44:16 Ọkara nʼime osisi ndị a ka o ji emenwu ọkụ; nʼelu ya kwa ka ọ na-esi nri ya, ọ na-ahụnye anụ, were tajuo afọ ya. Nkụ ahụ ka o ji anya ọkụ na-asị, “Ahaa, ahụ ekpola m ọkụ; ahụla m ọkụ.”
ISA 44:17 Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị; Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe. Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị, “Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!”
ISA 44:18 Ha amaghị ihe ọbụla; ha adịghị aghọtakwa, nʼihi na-emechiela anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ, mechiekwa uche ha, ka ha ghara ịghọta.
ISA 44:19 Ọ dịghị onye na-anọdụ chee echiche, ọ dịghịkwa onye nwere ihe ọmụma maọbụ nghọta ị sị, “Ụfọdụ nʼime osisi a ka m ji kwanye ọkụ, Ọ bụladị ghee achịcha nʼelu icheku ọkụ ya, ejikwa m ụfọdụ nʼime ya hụọ anụ m tara. M ga-esite na nke fọdụrụ mepụta ihe rụrụ arụ? Ọ bụ ogwe osisi ka m ga-akpọ isiala nye?”
ISA 44:20 Onye na-adịghị eche ụdị echiche a bụ onye nzuzu, nke na-eji ntụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-azụ onwe ya. Ọ pụghị ịnapụta onwe ya, maọbụ jụọ onwe ya ajụjụ sị, “Ihe a m ji nʼaka m, nke m na-akpọ chi, ọ bụghị okwu ụgha ka ọ bụ?”
ISA 44:21 “Cheta ihe ndị a, gị Jekọb, nʼihi na gị bụ Izrel, ị bụ ohu m. Ọ bụ m kpụrụ gị, ị bụ ohu m; gị bụ Izrel, agaghị m echezọ gị.
ISA 44:22 Ehichapụla m njehie gị niile; dịka igwe ojii, hichapụkwa mmehie gị dịka igirigi ụtụtụ. Lọghachikwute m, nʼihi na akwụọla m ụgwọ ịgbapụta gị.”
ISA 44:23 Bụọnụ abụ oke ọṅụ, unu eluigwe, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ya; tienụ oke mkpu, unu ụwa dị nʼala. Tienụ mkpu ọṅụ, unu ugwu niile, unu bụ oke ọhịa niile na osisi ọbụla nke dị nʼime gị, nʼihi na Onyenwe anyị agbapụtala Jekọb, na-egosikwa ebube ya nʼIzrel.
ISA 44:24 “Otu a, Onyenwe anyị na-ekwu, Onye mgbapụta unu, onye ahụ kpụrụ unu nʼime afọ: Mụ onwe bụ Onyenwe anyị, Onye kere ihe niile, onye gbatipụrụ eluigwe, onye gbasara ụwa naanị mụ onwe m,
ISA 44:25 onye na-emebi ihe ịrịbama niile nke ndị amụma ụgha na-emekwa ka ndị na-ajụta ase ghọọ ndị nzuzu, onye na-ekpu ihe ọmụmụ ndị maara ihe ihu nʼala tụgharịa ya, ha ghọọ ihe nzuzu,
ISA 44:26 onye na-eme ka okwu ndị ohu ya mezuo meekwa ka amụma ndị ozi ya buru mezuo, onye na-asị banyere Jerusalem, ‘A ga-ebikwa nʼime ya ọzọ,’ na-asịkwa banyere obodo niile nke Juda, ‘A ga-ewughachi ha,’ banyere mkpọmkpọ ebe ha niile, ‘Aga m ewulikwa ha.’
ISA 44:27 Onye ahụ na-asị, ogbu mmiri, ‘Takọrọ, aga m emekwa ka iyi ya niile takọrọsịa,’
ISA 44:28 Onye na-asị banyere Sairọs, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ọ ga-emezukwa ihe niile na-adị m mma; Ọ ga-asịkwa banyere Jerusalem, “Ka ewugharịa ya,” ma banyere ụlọnsọ, “Ka ehiwe ntọala ya.” ’
ISA 45:1 “Nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu nye ohu ya nke o tere mmanụ, bụ Sairọs, onye m ga-eji aka nri ya megide mba niile, mee ka ha nọrọ nʼokpuru ya, napụkwa ndị eze ngwa agha ha niile, megheere ya ọnụ ụzọ niile nke na ọ dịkwaghị ọnụ ụzọ ama a ga-emechibido ya.
ISA 45:2 Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị kwazee ugwu ukwu niile, tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche.
ISA 45:3 Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara, akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche. Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile.
ISA 45:4 Nʼihi Jekọb bụ ohu m, nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m, ka m ji kpọọ gị aha gị nyekwa gị aha nke nsọpụrụ, maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ.
ISA 45:5 Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. Ọ bụ ezie na ị maghị m, ma aga m eme ka ị dịrị ike.
ISA 45:6 Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m. Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị.
ISA 45:7 Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị. Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi. Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile.
ISA 45:8 “Gị, eluigwe, zodata ezi omume m ka mbara eluigwe na-ezodakwa ya dịka mmiri. Ka ala meghee onwe ya, ka nzọpụta pupụta, ka ezi omume soro ya puokwa dịka ahịhịa. Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị kere ha niile.
ISA 45:9 “Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ, mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejuju nʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala. Ụrọ ọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị, ‘Gịnị ka i ji m akpụ?’ Ka ọrụ gị ọ ga-asị, ‘Lee, ọ dịghị aka abụọ o nwere’?
ISA 45:10 Ahụhụ na-adịrị nwantakịrị ahụ gwara nna ya okwu sị, ‘Gịnị ka ị mụtara na nwa?’ maọbụ sịkwa nne ya, ‘Gịnị bụ ihe ị mụpụtara?’
ISA 45:11 “Otu a ka Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel, Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị; banyere ihe ndị gaje ime ị na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m, maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m?
ISA 45:12 Ọ bụ mụ onwe m kere ụwa, keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya. Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe, nyekwa kpakpando niile iwu.
ISA 45:13 M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m: M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi. Ọ ga-ewughachi obodo m, mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha, ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.”
ISA 45:14 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kush na ndị Saba ahụ toro ogologo, ha ga-abịakwute gị, ha ga-abụ nke gị; ha ga-esokwa gị nʼazụ dịka ndị mkpọrọ e kere agbụ. Ha ga-akpọ isiala nʼihu gị rịọ gị arịrịọ, na-asị, ‘Nʼezie, ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.’ ”
ISA 45:15 Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel. Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya.
ISA 45:16 A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere, e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere.
ISA 45:17 Ma Onyenwe anyị ga-eji nzọpụta nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi zọpụta Izrel. Ihere agaghị eme ha. A gaghị etinyekwa ha nʼọnọdụ ihe ihere ruo mgbe ebighị ebi.
ISA 45:18 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe sịrị, ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha. Ọ bụ ya, bụ Chineke, onye zubere ma kee ụwa, tọkwaa ntọala ya. O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu, kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya. Ọ sịrị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.
ISA 45:19 Ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu, site nʼotu ebe nʼala nke ọchịchịrị. Agwaghị m mkpụrụ Jekọb ‘Chọọnụ m nʼefu.’ Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị na-ekwu eziokwu, Ana m ekwupụta ihe ziri ezi.
ISA 45:20 “Chịkọtaanụ onwe unu, gbakọtanụ, bịanụ nso, unu ndị si na mba niile gbapụta ọsọ ndụ. Ha amaghị ihe bụ ndị a na-ebugharị chi osisi e ji aka mee, ndị na-ekpekwara chi ndị ahụ na-enweghị ike ịzọpụta ekpere.
ISA 45:21 Kwupụtanụ ihe kwesiri ịdị, gosinụ ya, ka ha gbaakọkwa izu. Onye buru ụzọ kwuo ihe ndị a nʼoge gara aga, onye kwupụtara ya site na mgbe ochie? Ọ bụghị mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị? Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị mụ onwe m, Chineke onye ezi omume na Onye nzọpụta; ọ dịghị onye ọzọ dị ma ewezuga m.
ISA 45:22 “Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu. Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa. Nʼihi na ọ bụ naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.
ISA 45:23 Ejirila m onwe m ṅụọ iyi, ọnụ m ekwupụla okwu nʼezi omume, bụ okwu nke na-enweghị mgbanwe: Nʼihu m ka ikpere niile ọbụla ga-egbu nʼala; mụ ka ire niile ọbụla ga-aṅụrụ iyi.
ISA 45:24 E, ha ga-ekwupụta sị, ‘Ọ bụ nʼime Onyenwe anyị naanị ka ezi omume na ike dị.’ ” Ndị niile na-akpọ ya asị ga-abịakwute ya. Ihere ga-emekwa ha.
ISA 45:25 Ma agbụrụ niile nke Izrel ga-achọta nnapụta ha nʼime Onyenwe anyị, ọ bụkwa na ya ka ha ga-anya isi.
ISA 46:1 Bel na Nebo, arụsị ndị Babilọn makpu amakpu. Lee, arụsị niile ha ka ebukwasịrị ha nʼazụ ịnyịnya ibu. Arụsị niile apịrị apị bụ nke a na-ebugharị bụ ibu dị arọ, ibu arụ nye ụmụ anụmanụ na-ada mba!
ISA 46:2 Ha makpuuru, rudakọkwa ala nʼotu; ha enweghị ike iwezuga ibu ndị a nʼonwe ha, ha onwe ha kwa, a dọtala ha nʼagha.
ISA 46:3 “Geenụ m ntị, unu ụmụ ụmụ Jekọb, unu ndị fọdụrụ nʼụlọ Izrel, unu bụ ndị m na-elekọta siterị na mgbe a mụrụ unu na-akpọgharịkwa unu siterị na mgbe amụpụtara unu.
ISA 46:4 Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya, ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu. Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu. Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.
ISA 46:5 “Onye ka unu ga-asị na o yiri m? Onye kwa ka mụ na ya ha? Onye ka unu ga-eji tụnyere m?
ISA 46:6 Ụfọdụ mmadụ na-emeghe akpa ego ha wụpụta ọlaedo dị nʼime ya, na-atụpụtakwa ọlaọcha nʼihe ọtụtụ, were ya goo onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ka o jiri ya kpụọrọ ha chi, emesịa, ha na-akpọ isiala na-efe arụsị ahụ ofufe.
ISA 46:7 Ha na-ebuli arụsị ahụ buru ya nʼubu ha, buru ya debe ya nʼọnọdụ ya, nʼebe ahụ ka ọ na-akwụrụ. Ọ dịghị apụ site nʼebe ahụ jegharịa. Ọ bụrụ na mmadụ e tikuo ya mkpu, ọ gaghị aza, ọ pụghị ịzọpụtakwa ha pụọ na nsogbu ha niile.
ISA 46:8 “Chetanụ nke a, ma tuleekwa ya, ka ọ dịgidekwa unu nʼobi, unu ndị na-enupu isi.
ISA 46:9 Chetakwanụ ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga, nʼihi na abụ m Chineke, chi ọzọ adịghịkwa. Naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị onye ọzọ dị ka m.
ISA 46:10 Ọ bụ m na-egosi ikpeazụ site na mmalite, ọ bụ m na-ekwu site na mgbe ochie ihe ga-eme nʼọdịnihu. Ana m asị, ‘nzube m ga-eguzogide. Ọ bụkwa ihe dị m mma nʼobi ka m ga-eme.’
ISA 46:11 Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ kpọọ anụ ufe, e, sitekwa nʼala ebe dị anya kpọọ nwoke ahụ ga-abịa mee nzube m. Nʼihi na ihe m kwuru ya ka m ga-eme ka o mezuo; ọ bụkwa atụmatụ m ka m ga-emekwa.
ISA 46:12 Geenụ m ntị, unu ndị isi ike, unu ndị nọpụrụ ezi omume m nʼebe dị anya.
ISA 46:13 Ana m eweta ezi omume nso, ọ dịghị nʼebe dị anya, nzọpụta m agaghị anọkwa ọdụ. Aga m enye Zayọn nzọpụta, nyekwa Izrel ịma mma m.
ISA 47:1 “Rịda nʼala, nọdụ na uzuzu, gị nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Babilọn, nọdụ nʼala na-ejighị ocheeze, gị eze nwanyị obodo ndị Babilọn. Agaghị akpọkwa gị onye dị nro, maọbụ onye dị pekepeke.
ISA 47:2 Were nkume igwe nri gwee ọka, wepụ akwa ahụ i ji kpuchie ihu gị. Chilite uwe mwụda gị, kpughepụ ogwe ụkwụ gị, mgbe ị na-agabiga iyi dị iche iche.
ISA 47:3 A ga-ekpughe ọtọ gị, tinyekwa gị nʼọnọdụ ihere. Nʼihi na aga m abọtara ndị m ọbọ, agaghị m elekwa anya nʼazụ.”
ISA 47:4 Otu a ka Onye mgbapụta anyị kwuru, Onye ga-azọpụta Izrel. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye nsọ Izrel.
ISA 47:5 “Nọdụ duu, baa nʼime ọchịchịrị, gị eze obodo nke ndị Kaldịa; Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ a ga-akpọ gị nwanyị nwe alaeze dị iche iche.
ISA 47:6 Ewesoro m ndị m iwe, mee ndị ahụ bụ ihe nketa m ka ha ghọọ ihe na-adịghị nsọ. Eweere m ha tinye gị nʼaka, ma i gosighị ha obi ebere. Ọ bụladị ndị bụ agadi nʼetiti ha ka ị bokwasịrị ibu arọ.
ISA 47:7 I kwuru sị, ‘Abụ m eze nwanyị ruo mgbe ebighị ebi!’ Ma i cheghị echiche banyere ihe ndị a, ị tụgharịghị uche banyere ihe pụrụ ime.
ISA 47:8 “Ugbu a gee ntị, gị onye na-eme dịka o si tọọ gị ụtọ. Gee ntị, gị onye na-anọ nʼudo, na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị m dị, o nweghị onye ọzọ ka m nʼụwa. O nweghị mgbe m ga-adị ka nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ dịka nwanyị ụmụ ya nwụrụ.’
ISA 47:9 Ma lee anya! Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gị na mberede. Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa. Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile, agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju.
ISA 47:10 Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’ Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị, mgbe ị na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’
ISA 47:11 Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị, ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya. Oke mbibi ga-adakwasị gị nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị; Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya ga-abịakwasị gị na mberede.
ISA 47:12 “Dokọtazie ọgwụ okike gị niile, na ihe mgbaasị gị niile. Ihe ndị ahụ niile i jirila na-eche onwe gị siterị na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ma eleghị anya ha pụrụ inyere gị aka nʼoge dị nʼihu. Ị pụrụ iji ha menye ndị iro gị ụjọ, maọbụ mee ka ha maa jijiji.
ISA 47:13 Ndụmọdụ niile a na-enye gị adịghị enyere gị aka. Mee ka ndị ahụ ihe banyere ngagharị ọnwa na kpakpando doro anya bịa nso. Kpọpụta ndị ahụ na-esite nʼihe ha hụrụ na kpakpando akọwa ihe ga-eme site nʼotu ọnwa ruo nʼọnwa nke ọzọ. Kpọkuo ha ka ha zọpụta gị site na nsogbu nke na-aga ịbịakwasị gị.
ISA 47:14 Lee, ha bụ ihe efu dịka ahịhịa kpọrọ nkụ. Ọkụ ga-erechapụkwa ha. Ha apụghịkwa ịzọpụta onwe ha site nʼọkụ ahụ na-enwusi ike. Nʼihi na ọkụ ahụ adịghị ka ọkụ a na-akwanye, nke a na-anya nʼoge oyi.
ISA 47:15 Lee ihe ndị a na-enyocha kpakpando ga-emere gị, bụ ndị ị na-aṅa ntị na ndụmọdụ ha site na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ha ga-ahapụ gị gaa nʼụzọ nke aka ha; ị gaghị enwekwa onye ga-azọpụta gị.
ISA 48:1 “Geenụ ntị na nke a, unu agbụrụ Jekọb, unu ndị a na-akpọ nʼaha Izrel, ndị si nʼagbụrụ Juda pụta. Unu ndị na-eji aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi, ndị na-akpọku aha Chineke nke Izrel, ma ọ bụghị nʼeziokwu maọbụ nʼezi omume.
ISA 48:2 Unu ndị na-akpa nganga na unu bụ ndị bi nʼobodo dị nsọ, ndị na-anyakwa isi na unu na-adabere na Chineke Izrel. Onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
ISA 48:3 Nʼoge gara aga ka m kwuru ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Mgbe m kwupụrụ ya, emekwara m ka ihe ahụ m kwuru mezuo.
ISA 48:4 Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị isiike, matakwa na akwara dị unu nʼolu bụ igwe a na-apụghị ịrọji arọji. Amakwaara m na egedege ihu unu bụ bronz.
ISA 48:5 Ọ bụ ya mere m ji buru ụzọ gwa unu nʼoge gara aga ihe m gaje ime, ka unu ghara ị sị, ‘Ọ bụ arụsị anyị mere ya. Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na chi ọla m nyere iwu ka ha mee!’
ISA 48:6 Unu anụla ama m na-agba, hụkwa ka ha na-emezu, ma unu ajụla ikwere na ọ bụ eziokwu. “Site ugbu a gawa, aga m agwa unu ihe ọhụrụ nke m na-agwabeghị unu na mbụ.
ISA 48:7 Ọ bụ ugbu a ka e kere ya, ọ bụghị na mgbe ochie. Unu anụtụbeghị ihe banyere ya mbụ, ya mere, unu agaghị asị, ‘Ọ bụ ihe maara ihe banyere ya.’
ISA 48:8 E, ị nụbeghị, ị maghịkwa, site na mgbe ochie ntị gị egheghị oghe. Nʼihi na amaara m na ị bụ onye aghụghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye a na-akpọ onye nnupu isi site nʼafọ nne ya.
ISA 48:9 Ma nʼihi aha m, ka m na-eme ka ọnụma m jụrụ nʼihi otuto m, a na m egbochi ya nʼebe ị nọ, ka a ghara ikpochapụ unu kpamkpam.
ISA 48:10 Lee, anụchaalam unu, ma ọ bụghị dịka e si anụcha ọlaọcha nʼọkụ. E, anwaleela m unu nʼoke ọkụ nke ahụhụ.
ISA 48:11 Nʼihi mụ onwe m, e, nʼihi mụ onwe m, ka m na-eme nke a. Aga m esi aṅaa hapụ ka m bụrụ onye emere ka aha m ghara ịdị nsọ? Agaghị m enye onye ọzọ otuto m.
ISA 48:12 “Geenụ m ntị, gị Jekọb, na gị Izrel onye m kpọrọ. Mụ onwe m bụ onye ahụ; Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ.
ISA 48:13 Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa. Ọ bụkwa aka nri m gbasara eluigwe. Mgbe m kpọrọ ha oku ha na-abịa guzo nʼihu m.
ISA 48:14 “Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị. Onye nʼetiti arụsị ndị a gosiri ihe ndị a na-aga ime? Onye ahụ Onyenwe anyị họọrọ ka ya na ya dị na mma ga-emezu nzube ya megide Babilọn, aka ya ga-emegide ndị Kaldịa.
ISA 48:15 Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya; e, akpọọla m ya. Aga m eme ka ọbịa nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma.
ISA 48:16 “Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a: “Site na mkpọsa mbụ ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu; mgbe o mere anọ m nʼebe ahụ.” Ma ugbu a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ezitela m, o mejupụtala m na Mmụọ ya.
ISA 48:17 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu, na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso.
ISA 48:18 A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile, udo unu gaara na-eru dịka osimiri, ọdịmma unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri.
ISA 48:19 Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja, ụmụ unu gaara a dị ka mkpụrụ ọkụkụ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, a gaghị ehichapụkwa aha ha, maọbụ bibie nʼihu ha.”
ISA 48:20 Sitenụ na Babilọn pụọ, gbanarịnụ ndị Kaldịa! Werenụ olu iti mkpu ọṅụ kwusaa inwere onwe unu a. Meenụ ka ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa nụrụ ya sịnụ, “Onyenwe anyị agbapụtala ohu ya Jekọb.”
ISA 48:21 Mgbe O duuru ndị ya jee ije nʼọzara, ala kpọrọ nkụ, akpịrị akpọghị ha nkụ. O mere ka mmiri si nʼoke nkume sọpụtara ha, e, ọ kpọwara oke nkume mee ka mmiri sọpụta.
ISA 48:22 Onyenwe anyị sịrị, “Ọ dịghị udo dịrị ndị na-emebi iwu.”
ISA 49:1 Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu, nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya. Onyenwe anyị kpọrọ m tupu amụọ m. Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m.
ISA 49:2 O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha. O zobere m nʼaka ya kpuchie m. O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ nke o zoro nʼime akpa àkụ ya.
ISA 49:3 Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel. Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma na ike m.”
ISA 49:4 Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ. Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe. Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị, ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.”
ISA 49:5 Ma ugbu a Onyenwe anyị na-asị, Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi; ka ọ kpọghachite Jekọb nye ya ka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya, nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya Onyenwe anyị, Chineke m aghọkwaarala m ike m.
ISA 49:6 Ọ sịrị, “Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu, ịkpọghachita ebo niile nke Jekọb na ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere. Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.”
ISA 49:7 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta na Onye nsọ Izrel na-agwa onye ahụ a na-elelị anya, onye ahụ mba kpọrọ ihe arụ, e, onye ahụ ndị na-achị achị mere ka ọ ghọọ ohu ha, “Ndị eze ga-eguzo ọtọ mgbe ị na-agafe. Ndịisi na-achị achị ga-akpọ isiala nye gị, nʼihi na Onyenwe anyị, Onye kwesiri ntụkwasị obi, Onye nsọ Izrel, ahọpụtala gị.”
ISA 49:8 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: “Nʼoge amara m, aga m aza unu, nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka. Aga m echebe unu, mee ka unu bụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ, iweghachite ala ahụ na ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu;
ISA 49:9 na-asị ndị mkpọrọ, ‘Pụtanụ,’ na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’ “Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ, ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile.
ISA 49:10 Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ. Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo ha nʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri.
ISA 49:11 Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ, meekwa ka okporoụzọ niile guzozie.
ISA 49:12 Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya, ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ, ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.”
ISA 49:13 Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile; ka ụwa ṅụrịa ọṅụ. Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha.
ISA 49:14 Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ; Onyenwe m echefuola m.”
ISA 49:15 “Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara, hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya? Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ, ma agaghị m echezọ unu.
ISA 49:16 Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m, nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide.
ISA 49:17 Ụmụ gị emeela ngwangwa lọghachite, ndị ahụ mere ka ị tọgbọrọ nʼefu ga-esi nʼime gị pụọ.
ISA 49:18 Welie anya gị abụọ lee gburugburu, legharịa anya, ụmụ gị niile na-ezukọta na-alọghachikwute gị. Dịka m na-adị ndụ,” ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ị ga-eyi ha niile dịka ọla ịchọ mma, ị ga-ekekwa ha dịka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si eme.
ISA 49:19 “Ọ bụ ezie na e bibiri gị, mee ka ị tọgbọrọ nʼefu, ala gị abụrụ nkpọnkpọ ebe, ma ugbu a, ị gaghị ezuru ndị gị, otu a kwa, ndị ahụ ripịara gị ga-anọ gị nʼebe dị anya.
ISA 49:20 Ụmụ niile a mụrụ nʼoge ọnwụ gbabara gị aka, ga-asịkwa na ntị gị, ‘Ebe a dịrị anyị oke ntakịrị, nye anyị ebe sara mbara karịa nke anyị ga-ebi nʼime ya.’
ISA 49:21 Mgbe ahụ, ị ga-eche nʼime onwe gị sị, ‘Onye mụtaara m ọtụtụ ụmụ ndị a niile? A dịrị m ka nwanyị na-amụghị nwa maọbụ onye ụmụ ya nwụchara. Onye ajụrụ ajụ na nke e mere ka ọ gaa biri nʼala ọzọ. Mụ onwe m fọdụrụ, naanị m. Onye kwa mụụrụ m ụmụ ndị a? Onye zụlitere ha?’ ”
ISA 49:22 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Lee, aga m akpọku ndị mba ọzọ, weliere ha ọkọlọtọ m, ha ga-ekulatara gị ụmụ gị ndị ikom nʼaka ha. Ụmụ ndị inyom ka ha ga-ekukwasị nʼubu ha kulatakwa ha.
ISA 49:23 Ndị eze ga-abụkwa ndị nna na-azụ ụmụ gị, ndị eze nwanyị ha ga-abụkwa ndị inyom na-enye ụmụ gị ara. Ha ga-akpọ isiala nye gị, rachakwaa aja dị nʼụkwụ gị abụọ. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, matakwa na ihere agaghị eme ndị niile na-ele anya inyeaka m.”
ISA 49:24 A ga-anara dike nʼagha ihe ọ lụtara nʼagha, maọbụ zọpụta ndị a dọọrọ nʼagha site nʼaka onye afọ tara mmiri?
ISA 49:25 Ma otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼezie, a ga-esi nʼaka ndị bụ dike nʼagha pụnara ha ndị ha dọtara nʼagha. A ga-esitekwa nʼaka onye na-akpa ike napụta ya ihe ọ dọtara nʼagha. Nʼihi na aga m ebuso ha agha bụ ndị niile na-ebuso gị agha. Aga m anapụtakwa ụmụ gị.
ISA 49:26 Aga m eme ka ndị na-akpagbu gị rie anụ ahụ onwe ha; ha ga-aṅụ ọbara onwe ha ṅụbiga ya oke, dịka mmanya. Mgbe ahụ, ihe niile bụ mmadụ nʼụwa ga-amata, na mụ onwe m Onyenwe anyị, bụ Onye na-azọpụta gị, Onye mgbapụta gị, na Onye dị ike nke Jekọb.”
ISA 50:1 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Olee ebe akwụkwọ m ji gbaa nne unu alụkwaghị m dị bụ nke m ji chụpụ ya? Ma ọ bụ onye nʼime ndị m ji ụgwọ ka m resiri unu? Ọ bụ nʼihi mmehie unu ka e ji ree unu; nʼihi mmebi iwu unu ka e jiri chụọ nne unu.
ISA 50:2 Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị onye nọ ya mgbe m bịara? Gịnị mere o nweghị onye zara m mgbe m kpọrọ oku? Ọ pụtara na aka m dị mkpụmkpụ ịzọpụta unu? Ọ ga-abụ na m enwekwaghị ike ịzọpụta? Nʼihi na enwere m ike ịbara osimiri mba mee ya ka ọ ghọọ ala akọrọ. Enwere m ike ime ka osimiri ghọrọ ọzara, ka azụ niile dị nʼime ya nwụọ nʼihi enweghị mmiri.
ISA 50:3 Ọ bụ mụ bụ onye ahụ na-eme ka ọchịchịrị kpuchie ihu eluigwe, ka ihu eluigwe dịrị ka ihu onye na-eru ụjụ.”
ISA 50:4 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ. Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m, meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya.
ISA 50:5 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ, ma enupughị m isi, a tụgharịkwaghị m azụ.
ISA 50:6 Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe; agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m. Ezopụghị m ihu m nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ.
ISA 50:7 Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka, ihere agaghị eme m. Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ, a maara m na ihere agaghị eme m.
ISA 50:8 Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso. Onye ga-apụta ibo m ebubo? Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu! Onye nwere ebubo megide m? Ya bịa ka anyị kwuo ya.
ISA 50:9 Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Onye pụrụ ịma m ikpe? Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe, nla ga-erichapụkwa ha.
ISA 50:10 Onye nʼetiti unu bụ onye ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị, na-egekwa ntị nʼokwu odibo ya? Ka onye ahụ na-eje ije nʼọchịchịrị, nke na-enweghị ìhè ọbụla, tụkwasị obi nʼaha Onyenwe anyị daberekwa na Chineke ha.
ISA 50:11 Ma lee, unu niile ndị na-amụnye ọkụ, ndị meere onwe ha ọwaọkụ, nke unu ji na-ejegharị nʼọchịchịrị, gaanụ nʼihu na-ejegharị nʼìhè ọkụ ahụ unu mụnyeere onwe unu. Ihe unu ga-anata site nʼaka Onyenwe anyị bụ ihe mwute nke ga-abịakwasị unu.
ISA 51:1 Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume, ndị na-achọ Onyenwe anyị! Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya. E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya!
ISA 51:2 Legidenụ Ebraham bụ nna unu na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu. Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya, ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba.
ISA 51:3 Onyenwe anyị aghaghị ịkasị Zayọn obi, werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ, ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden, ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke Onyenwe anyị. Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya, inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa.
ISA 51:4 Ndị m, geenụ m ntị; ṅaa ntị, gị Izrel mba nkem, nʼihi na iwu m ga-esi nʼọnụ m pụọ; ikpe ikpe ziri ezi m ga-aghọkwara mba niile ìhè.
ISA 51:5 Ezi omume m na-abịaru unu nso ọsịịsọ, nzọpụta m na-adịkwa nso. Aga m achịkwa mba niile. Mba dị anya ga na-ele anya ọbịbịa m; ha ga na-ele anya nzọpụta nke m ga-azọpụta ha.
ISA 51:6 Welienụ anya unu lee anya nʼelu, leekwanụ anya nʼụwa, nʼihi na mbara eluigwe ga-agba barịị fuo, dịka anwụrụ ọkụ; ụwa ga-aka nka dịka akwa, ndị bi nʼime ya ga-anwụkwa dịka ijiji. Ma nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ezi omume m ga-adịgidekwa, ọ gaghị agwụ agwụ.
ISA 51:7 Geenụ m ntị, unu niile ndị maara ihe ọma, unu ndị na-anabata iwu m nʼobi unu. Unu atụla egwu ihe ndị mmadụ ga-asị unu, unu atụkwala egwu nkwutọ ha ga-ekwutọ unu.
ISA 51:8 Nʼihi na nla ga-eri ha dịka o si eri akwa. Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ. Ma ezi omume m, na obi ebere, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Nzọpụta m ga-adịkwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
ISA 51:9 Teta, teta, yikwasị onwe gị ike, gị aka Onyenwe anyị, bilie, dịka ụbọchị ndị gara aga, dịka ọgbọ nke mgbe ochie. Ọ bụghị gị gbubisịrị Rehab ma dụgbukwaa anụ ọjọọ ahụ?
ISA 51:10 Ọ bụghị gị mere ka osimiri taa? Mmiri ahụ dị omimi. Ọ bụghị gị mekwara ka okporoụzọ dịrị nʼetiti ya, ebe ndị ahụ ị gbapụtara si gafee?
ISA 51:11 Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha, oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha, iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.
ISA 51:12 “Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi. Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ, ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa,
ISA 51:13 na ị na-echefu Onyenwe anyị bụ onye kere unu, onye na-esetipụ eluigwe, onye tọkwara ntọala niile nke ụwa; na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niile nʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ, onye nke kpebiri ibibi unu? Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị?
ISA 51:14 Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala. Ha agaghị anwụ nʼime olulu, nri agakwaghị akọ ha.
ISA 51:15 Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
ISA 51:16 Etinyela m okwu m nʼọnụ gị, chebekwa gị nʼọbụaka m. Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya, dokwaa ntọala nke ụwa. Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’ ”
ISA 51:17 Teta, teta, bilie gị Jerusalem, gị onye ṅụrụ site nʼaka Onyenwe anyị, bụ iko nke oke iwe ya. Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa.
ISA 51:18 Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ, nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme, maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ o kwesiri ịgbaso.
ISA 51:19 Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị. Onye ga-akasị gị obi? Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha, onye ga-akasị gị obi?
ISA 51:20 Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba. Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile, dịka mgbada ọnya mara. Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị na ịba mba nke Chineke gị.
ISA 51:21 Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu, ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya.
ISA 51:22 Lee ihe Onyenwe anyị kwuru, bụ Chineke unu, onye ihe banyere ndị ya na-emetụ nʼobi. “Lee, aga m esite nʼaka gị wezuga iko ahụ mere ka ị dagbugharịa, ị gaghị aṅụkwa site nʼiko ọnụma ahụ ọzọ.
ISA 51:23 Ma m ga-etinye ya nʼaka ndị ahụ na-akpagbu gị, bụ ndị sịrị gị, ‘makpuru nʼala ka anyị gaa ije nʼelu ahụ gị.’ I mere azụ gị ka ọ dị ka ala, dịka okporoụzọ ebe ndị mmadụ si aga ije.”
ISA 52:1 Teta, teta gị Zayọn, yikwasị onwe gị ike dịka uwe! Yikwasị onwe gị uwe mara mma, gị Jerusalem, obodo dị nsọ. Ndị a na-ebighị ugwu na ndị rụrụ arụ agaghị abata nʼime gị ọzọ.
ISA 52:2 Kụchapụ aja dị nʼahụ gị, bilie ọtọ, gị Jerusalem, nọdụ ala nʼocheeze gị. Tọpụ onwe gị site nʼagbụ igwe e kere gị nʼolu, gị ada Zayọn, a dọtara nʼagha.
ISA 52:3 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼefu ka erere unu, anaghị ndị zụrụ unu ego ọbụla, ọ bụghịkwa ego ka a ga-eji gbapụta unu.”
ISA 52:4 Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Na mbụ, ọ bụ nʼala Ijipt ka ndị m gara biri, ugbu a, ọ bụ ndị Asịrịa na-akpagbu ha.
ISA 52:5 “Ma ugbu a, gịnị ka m nwere nʼebe a?” bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara. “Ebe ọ bụ na e durula ndị m pụọ nʼefu, ndị na-achị ha na-akwakwa ha emo na-achị ha ọchị nlelị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha na-ekwulukwa aha m ogologo ụbọchị niile.
ISA 52:6 Nʼihi ya, ndị m ga-ama aha m; nʼihi nke a, ha ga-amarakwa nʼụbọchị ahụ na ọ bụ Mụ onwe m kwuru na ọ ga-eme. E, ọ bụ mụ onwe m.”
ISA 52:7 Lee ka ha si maa mma nʼelu ugwu bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma, onye na-ekwusa okwu udo, e, onye na-eweta akụkọ ọma, onye na-agbasa akụkọ banyere nzọpụta, onye na-asị Zayọn, “Lee, Chineke gị bụ eze!”
ISA 52:8 Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu, ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ. Nʼihi na mgbe Onyenwe anyị ga-alọghachi Zayọn, ha ga-ahụ ya anya.
ISA 52:9 Tienụ mkpu ọṅụ unu mkpọmkpọ ebe niile e tikpọrọ etikpọ na Jerusalem, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ gbapụtala Jerusalem.
ISA 52:10 Onyenwe anyị ga-eme ka mba niile hụrụ ike ya dị nsọ; ebe niile ụwa sọtụrụ ga-ahụkwa nzọpụta Chineke anyị.
ISA 52:11 Wezuganụ onwe unu, wezuganụ onwe unu, sinụ nʼebe ahụ pụọ. Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka. Sitenụ nʼetiti ya pụta, dịrịnụ ọcha, unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke ụlọ Onyenwe anyị.
ISA 52:12 Ma unu agaghị eji ọkụ ọkụ pụọ, unu agakwaghị agbapụ ọsọ, nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebutere unu ụzọ, ọ bụkwa ya, Chineke Izrel, ga-echebe unu nʼazụ.
ISA 52:13 Lee, ohu m ga-enwe uche, a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ.
ISA 52:14 Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ; otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ, anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ.
ISA 52:15 Otu a ka ọ ga-esi fesaa ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-emechikwa ọnụ ha nʼihi ya, ọ bụ ihe a na-agwaghị ha ka ha ga-ahụ, ihe ha a ka anụbeghị, ka ha ga-aghọtakwa.
ISA 53:1 Onye kweere ozi anyị, ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?
ISA 53:2 Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome, dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ. O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya. O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike.
ISA 53:3 Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya. Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ. Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ. E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla.
ISA 53:4 Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru, burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile, ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ, onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ.
ISA 53:5 Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị: ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ. E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ; ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike.
ISA 53:6 Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ; onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya. Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya ajọ omume anyị niile.
ISA 53:7 A kpagburu ya, mesie ya ihe ike, ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta. E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị, otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya.
ISA 53:8 Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya. Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ ya weliri olu kwuo okwu? Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ; maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe.
ISA 53:9 E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu, ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya, ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere, ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta.
ISA 53:10 Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ. Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie. Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge. Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya.
ISA 53:11 Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ, ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya, site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume, ọ ga-ebukwa mmehie ha niile.
ISA 53:12 Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba, ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha, nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ, a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ, rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ.
ISA 54:1 “Bụọ abụ, gị nwanyị aga, gị onye na-amụtaghị nwa; tie mkpu ọṅụ, tiwakwaa olu abụ, gị onye ime nwa na-emetụbeghị; nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị nwere di,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
ISA 54:2 “Mee ka ebe ụlọ ikwu gị saa mbara, gbasapụ akwa mgbochi ụlọ ikwu gị, egbochila gbasapụ aka; mee ka ụdọ gị dị ogologo, meekwa ka o sie ike nke ọma.
ISA 54:3 Nʼihi na nʼaka nri na nʼaka ekpe ka ị ga-agbasa gaa; ụmụ gị ga-achụpụ mba dị iche iche site nʼala ha, bichikwaa nʼobodo ha niile dakpọsịrị adakpọsị, nke tọgbọrọ nʼefu.
ISA 54:4 “Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ. Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala. Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị, na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị.
ISA 54:5 Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị, Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya.
ISA 54:6 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gị dịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ ya bụ nwunye alụtara na nwantakịrị, naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu.
ISA 54:7 “Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị. Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị
ISA 54:8 Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m zonarị gị ihu m, ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru.
ISA 54:9 “Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ, bibie ndụ ndị dị nʼime ya, ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ. Agakwaghị m abasiri gị mba ike.
ISA 54:10 Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile, wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha, ma obi ebere m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ, agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,” ka Onyenwe anyị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru.
ISA 54:11 “Gị, onye a na-emekpa ahụ, onye oke ikuku ụwa a na-ebugharị, nke onye ọbụla na-adịghị akasị obi, lee, aga m e ji nkume tọkwọisi wugharịa gị, jirikwa nkume ọma safaia dị oke ọnụahịa tọọ ntọala gị niile.
ISA 54:12 Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile, jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile. Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị.
ISA 54:13 Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe. Udo ha ga-adịkwa ukwu.
ISA 54:14 Nʼezi omume ka a ga-eme ka ị guzosie ike. Mmegbu ga-adịkwa anya site nʼebe ị nọ, nʼihi ya, ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla. Ọ dịghị ihe egwu ga-abịaru gị nso, nʼihi na a ga-ewezuga ha site nʼebe ị nọ.
ISA 54:15 Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa ịlụso gị ọgụ, ọ siteghị nʼaka m; onye ọbụla nke na-alụso gị ọgụ ga-abụ onye e meriri emeri.
ISA 54:16 “Lee, ọ bụ mụ onwe m kere ọkpụ ụzụ nke na-eji icheku afụ ọkụ o ji akpụ ihe agha nke mbibi. Ọ bụkwa m kere ndị agha ahụ mbibi bụ ọrụ ha.
ISA 54:17 Nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị ihe agha a kpụrụ megide gị nke ga-adị ire. Ọzọ, ị ga-emeri ndị niile kpọrọ gị ikpe mmegide. Nʼihi na nke a bụ ihe nketa dịrị ndị ohu Onyenwe anyị. Mkpepụta ha na-esite na m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
ISA 55:1 Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ, bịanụ na mmiri, unu ndị na-enweghị ego bịanụ zụọ, riekwa. Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla.
ISA 55:2 Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri? Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ? Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma!
ISA 55:3 “Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m! Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ. Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi, bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa.
ISA 55:4 Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama, ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche.
ISA 55:5 Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị, mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.”
ISA 55:6 Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya. Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso.
ISA 55:7 Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya, ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile. Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere, ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile.
ISA 55:8 “Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu, ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara.
ISA 55:9 “Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile.
ISA 55:10 Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri si esi nʼeluigwe ada nʼụwa na-alaghachighị nʼeluigwe ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala, mee ka ihe ubi pupụta, too eto, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri.
ISA 55:11 Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.
ISA 55:12 Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ, a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo. Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile nke ubi, ga-eti mkpu ọṅụ, kụọkwa aka nʼobi ụtọ.
ISA 55:13 Ebe ogwu na-eto na mbụ, osisi junipa ga-eto na ya; ebe uke toro, osisi mietul ga-eto na ya. Ihe ndị a ga-aghọrọ Onyenwe anyị aha dị ukwuu, nke ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.”
ISA 56:1 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị, “Debenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ihe ziri ezi. Nʼihi na nzọpụta m dị nso, ezi omume m ga-apụta ihe mgbe na-adịghị anya.
ISA 56:2 Ngọzị na-adịrị onye na-eme nke a, bụ onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike, onye ahụ nke na-edebe ụbọchị izuike m na-emerụghị ya, nke na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ihe ọjọọ.”
ISA 56:3 Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị, “Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.” Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị “Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.”
ISA 56:4 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile, ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ, na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike.
ISA 56:5 Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya, ihe ncheta na aha dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi.
ISA 56:6 Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru Onyenwe anyị ijere ya ozi, na ịhụ aha Onyenwe anyị nʼanya, nakwa ị bụ ndị ohu ya, ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya, na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike,
ISA 56:7 ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m, meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m. Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere nʼebe ịchụ aja m. Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche.”
ISA 56:8 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta, “Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala.”
ISA 56:9 Bịanụ, unu anụmanụ niile nke oke ọhịa. Bịanụ dọgbuo, unu ụmụ anụmanụ nke oke ọhịa.
ISA 56:10 Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì. Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ. Ha dị ka nkịta dara ogbi, nke na-adịghị agbọ ụja. Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ, na idina ndina nʼanya.
ISA 56:11 Ha bụ nkịta na-eribiga nri oke; ha adịghị enwe afọ ojuju. Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta, ha niile echela ihu nʼụzọ nke aka ha, onye ọbụla na-agbalịsị ike ịchọta uru nke ya.
ISA 56:12 Onye ọbụla na-asị, “Bịa ka m weta mmanya, ka anyị ṅụjuokwa mmanya nʼaba nʼanya afọ anyị. Echi ga-adịkwa ka taa, ma ọ bụkwanụ dị mma karịa.”
ISA 57:1 Ndị ezi omume na-ala nʼiyi, ma ọ dịghị onye ọbụla na-etinye ya nʼobi; a na-ewezuga ndị ji obi ha niile na-efe Chineke, ma ọ dịghị onye na-aghọta, na-ewezugara onye ezi omume pụọ nʼihu ihe ọjọọ.
ISA 57:2 Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha na-abanye nʼudo. Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ.
ISA 57:3 “Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị, unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna.
ISA 57:4 Onye ka unu na-akwa emo? Onye ka unu na-akọcha, na-arapụtakwara ire unu? Unu ọ bụghị ụmụ ndị nnupu isi, mkpụrụ ndị na-ekwu okwu ụgha?
ISA 57:5 Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ mgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla. Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ aja na ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu.
ISA 57:6 Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ, nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere. E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile na onyinye mkpụrụ ọka unu niile. Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu?
ISA 57:7 Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina, nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu.
ISA 57:8 Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile, ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị. Ị gbakụtara m azụ, yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị, ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ, imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ.
ISA 57:9 Ị were mmanụ jekwuru Molek meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba. Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị gaa na mba dị anya; ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ.
ISA 57:10 Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị, ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’ Ị chọtara ntute nye ndụ gị, ya mere, na ị daghị mba.
ISA 57:11 “Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a? Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu? Ị naghị echetakwa m, ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị? Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niile ka i ji hapụ ịtụ m egwu?
ISA 57:12 Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị, igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka.
ISA 57:13 Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị. Ikuku ga-eburu ha niile bufuo, naanị otu nkuume ga-ekutu ha. Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ ga-eketa ala ahụ; ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.”
ISA 57:14 A ga-asịkwa, “Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma. Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.”
ISA 57:15 Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu, onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru: “Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ, ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala, itute mmụọ nke onye e wedara nʼala, na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.
ISA 57:16 Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị, maọbụ na-egosi iwe m. Ọ bụrụ na m emee otu a, mmụọ ndị mmadụ ụwa niile ga-ada mba, ya na mkpụrụobi niile ahụ m ji aka m kpụọ.
ISA 57:17 Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ. Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ.
ISA 57:18 Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha. Aga m edu ha, kasịekwa ndị na-eru ụjụ nʼIzrel obi.
ISA 57:19 Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha. Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,” ka Onyenwe anyị kwuru. “Aga m agwọkwa ha.”
ISA 57:20 Ma ndị niile na-emebi iwu dị ka oke osimiri na-amagharị amagharị, nke na-adịghị ezu ike mgbe ọbụla. Ọ na-amapụtakwa ụrọ na apịtị.
ISA 57:21 “Ọ dịkwaghị udo dịrị onye na-emebi iwu,” ka Chineke kwuru.
ISA 58:1 “Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu. Welie olu gị dịka opi ike. Gwa ndị m nnupu isi ha, gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha.
ISA 58:2 Kwa ụbọchị ka ha na-achọ m ha na-eme dịka ọ na-agụ ha agụ ịmara ụzọ m niile, dịka a ga-asị na ha bụ mba na-eme ihe ziri ezi, ndị na-agbakụtaghị iwu Chineke ha azụ. Ha na-ajụ m maka ikpe ziri ezi, na-eme dịka ọ na-agụ ha agụụ ka Chineke bịaruo ha nso.
ISA 58:3 Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ, ma ị dịghị ahụta ya? Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala, ma ị dịghị ahụta nke a?’ “Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu, unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara.
ISA 58:4 Nʼoge ahụ, ọ bụ ise okwu na ịlụ ọgụ, ya na iti ibe unu ọkpọ nʼihi ajọọ obi ka unu ji emechi ụbọchị ibu ọnụ unu. Unu apụghị ibu ọnụ otu unu si eme taa na-ele anya ka anụ olu unu nʼelu.
ISA 58:5 Nke a ọ bụ ụdị obubu ọnụ nke m họpụtara, naanị ụbọchị nke ndị mmadụ ji eweda onwe ha nʼala? Ọ bụ naanị nke mmadụ ji ehulata isi ya nʼala dịka osisi achara, nke i dina nʼakwa mkpe na ntụ? Ọ bụ nke a ka unu na-akpọ obubu ọnụ, ụbọchị nke Onyenwe anyị nabatara?
ISA 58:6 “Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara: Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi, na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu, na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha na itiji yoku ọbụla?
ISA 58:7 Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị, ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye. Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe, ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ.
ISA 58:8 Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ. A ga-agwọkwa ọrịa gị niile. Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị, ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ.
ISA 58:9 Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa, ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a. “Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu, ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị,
ISA 58:10 ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri, nyere ndị nọ na mkpa aka, mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta, ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie.
ISA 58:11 Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile. Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ, meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike. Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma, dịka isi iyi na-adịghị ata ata.
ISA 58:12 Ndị gị ga-edozi mkpọmkpọ ebe ochie niile. Ha ga-ebulikwa ntọala nke mgbe ochie. A ga-akpọ unu ndị na-edozi mgbidi dara ada, ndị na-arụzikwa okporoụzọ nke ebe obibi.
ISA 58:13 “Ọ bụrụ na i debe ụkwụ gị site na-edebeghị ụbọchị izuike nsọ, sitekwa na-ime ihe ndị na-atọ gị ụtọ nʼụbọchị nsọ m, ọ bụrụ na ịkpọ ụbọchị izuike m ihe mmasị na ụbọchị nsọ Onyenwe anyị ihe a na-akwanyere ugwu, ọ bụrụ na ị sọpụrụ ya site na-emeghị ihe nʼụzọ nke gị, na-emeghị ọchịchọ nke obi gị, maọbụ ikwugheri ọnụ,
ISA 58:14 mgbe ahụ, ị ga-achọta ọṅụ gị nʼime Onyenwe anyị, m ga-emekwa ka ịnọkwasị nʼebe dị elu niile nke ala ahụ, meekwa ka irie oriri na ihe nketa nke nna gị Jekọb.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
ISA 59:1 Nʼezie, aka Onyenwe anyị adịghị mkpụmkpụ nke na o nweghị ike ịzọpụta, ntị ya adịghịkwa arọ nke na o nweghị ike ịnụ ihe.
ISA 59:2 Kama mmehie unu ekewapụla unu site nʼebe Chineke unu nọ; mmehie niile unu ezokwala ihu ya site nʼebe unu nọ, nke mere na ọ chọkwaghị ige ntị ọzọ.
ISA 59:3 Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara, mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ. Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha, ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ.
ISA 59:4 Ọ dịghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ dịkwaghị onye na-eji ikwesi ntụkwasị obi kpee ikpe. Ha na-adabere nʼịrụ ụka nʼenweghị isi, ha na-ekwu okwu ụgha, ha na-atụrụ ime okwu na ụka mụọkwa ajọ ihe.
ISA 59:5 Ha na-avụ akwa ajụala, na-akpakwa akwụ udide. Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ, mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta.
ISA 59:6 Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe, ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha. Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ, omume ihe ike jupụtara ha nʼaka.
ISA 59:7 Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie, ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere. Ha na-achụso echiche ajọ ihe, ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile.
ISA 59:8 Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ, ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso. Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ. Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo.
ISA 59:9 Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ, ezi omume adịghị erute anyị nso. Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ. Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị.
ISA 59:10 Anyị na-asọgharị ìsì na mgbidi dịka ndị na-enweghị anya, na-asọgharị isi dịka ndị na-enweghị anya; anyị na-ada na-akpọbi ukwu nʼetiti ehihie dịka a ga-asị na ọ bụ oge chi ojiji, nʼetiti ndị nwere ezi ndụ, anyị nọ ka ndị nwụrụ anwụ.
ISA 59:11 Anyị na-agbọ ụja dịka bịa; anyị na-akwasị akwa ike dịka nduru nʼeru ụjụ. Anyị na-ele anya ikpe ziri ezi, ma ọ dịghị eru anyị aka; anyị na-ele anya nzọpụta, ma ọ dị anya nʼebe anyị nọ.
ISA 59:12 Nʼihi na mmehie anyị amụbaala nʼihu Onyenwe anyị; ọ na-agbakwa ama megide anyị. E, anyị makwaara ụdị ndị mmehie anyị bụ, nʼihi na mmehie anyị dịkwa nʼihu anyị mgbe niile.
ISA 59:13 Anyị maara nnupu isi anyị na ngọnarị anyị gọnarịrị Onyenwe anyị; anyị esitela nʼiso Onyenwe anyị Chineke anyị wezuga onwe anyị, nọgide na-akpali mmegbu na nnupu isi. Okwu ọnụ anyị bụ okwu ụgha, nke anyị si nʼobi anyị tụpụta.
ISA 59:14 Ụlọ ikpe anyị niile adịghị achọ onye ezi omume; anyị amaghị ihe a na-akpọ ikpe ziri ezi. Eziokwu asọọla ngọngọ nʼama niile, ihe ziri ezi apụghị ịbata.
ISA 59:15 E, eziokwu alaala; onye ọbụla kwa nke na-achọ ibi ndụ ọma na-etinye onwe ya na nsogbu. Onyenwe anyị lere anya hụ ihe ọjọọ ndị a niile, nke na-enyeghị ya obi ụtọ; ọ hụkwara na ikpe ziri ezi adịghị.
ISA 59:16 Ọ hụrụ na anyị enweghị onye inyeaka ọbụla; o wutere ya na ọ dịghị onye na-arịọrọ anyị arịrịọ. Ọ bụ ya mere o ji bata site nʼike aka ya na nʼezi omume ya, bịa ịzọpụta anyị.
ISA 59:17 Ọ na-eyikwasị ezi omume dịka ngwa agha ikpuchi obi ya. Okpu nke nzọpụta ka ọ na-eyikwasịkwa nʼisi ya. Ọ bụkwa uwe ịbọ ọbọ na nke ekworo na ịnụ ọkụ na obi ka o ji kpuchie onwe ya.
ISA 59:18 Ọ ga-akwụghachi ndị iro ya dịka ajọ omume ha niile si dị. Iwe ọkụ ya ka ọ ga-eji megide ndị iro ya niile bi na mba dị anya.
ISA 59:19 Site nʼọdịda anyanwụ, ndị mmadụ ga-asọpụrụ aha Onyenwe anyị, sitekwa nʼọwụwa anyanwụ, ha ga-atụ egwu ebube ya. Nʼihi na ọ ga-abịa dịka idee mmiri nke nkume, Onyenwe anyị na-agba na-aga.
ISA 59:20 “Onye mgbapụta ga-abịa na Zayọn; ọ ga-abịakwute ụmụ Jekọb ndị na-esite na mmehie ha chegharịa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
ISA 59:21 “Ma mụ onwe m, nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Mmụọ m, nke dị nʼahụ gị, na okwu m niile nke m tinyere nʼọnụ gị, agaghị apụ nʼegbugbere ọnụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ ụmụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ agbụrụ gị. Ha ga-adịgide site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi,” ka Onyenwe anyị kwuru.
ISA 60:1 “Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala, ebube Onyenwe anyị awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ.
ISA 60:2 Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile, oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa, ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ.
ISA 60:3 Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị, ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị.
ISA 60:4 “Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu, ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị; ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa, ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ.
ISA 60:5 Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee, obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ, nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị, akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị.
ISA 60:6 Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia na Efaa ga-ejupụta nʼala gị, ma ndị sikwa nʼobodo Sheba ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ. Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị.
ISA 60:7 A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda. Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị. A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m. Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa.
ISA 60:8 “Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii, ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha?
ISA 60:9 Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere; ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ, na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya, ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile. Inye Onyenwe anyị bụ Chineke gị nsọpụrụ, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị.
ISA 60:10 “Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile. Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi. Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m, ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere.
ISA 60:11 Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ, ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche. A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha.
ISA 60:12 Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi; a ga-ekpochapụ ha.
ISA 60:13 “Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị. Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres, ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma. Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile.
ISA 60:14 Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị. Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ. Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo Onyenwe anyị, Zayọn nke Onye nsọ Izrel.
ISA 60:15 “Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu, onye mmadụ niile na-eweda nʼala, ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi; ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị.
ISA 60:16 Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị. Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.
ISA 60:17 Nʼọnọdụ bronz, aga m eweta ọlaedo, nʼọnọdụ igwe aga m eweta ọlaọcha. Nʼọnọdụ osisi, ọ ga-abụ ọla, nʼọnọdụ nkume, ọ ga-abụ igwe. M ga-eme ka udo bụrụ ndị nlekọta gị ezi omume ga-abụ onye na-achị gị.
ISA 60:18 Ihe ike agaghị adịkwa nʼala gị ọzọ. Agha niile ga-akwụsị, mbibi na ịla nʼiyi agaghị adịkwa. Mgbidi gị ga-aghọ Nzọpụta, ị ga-akpọkwa ọnụ ụzọ ama gị niile Otuto.
ISA 60:19 Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ, maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi, Chineke gị ga-abụkwa ebube gị.
ISA 60:20 Anwụ gị agaghị ada ada, ọnwa gị agaghị akwụsịkwa ịcha; nʼihi na Onyenwe anyị ga-abụrụ gị ìhè ụbọchị gị niile, iru ụjụ gị niile ga-agabigakwa.
ISA 60:21 Mgbe ahụ, ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume, ha ga-enwetakwa ala ahụ ruo ebighị ebi. Ha bụ ome nke m kụrụ, bụ ọrụ aka m, ime ka ịma mma m pụta ìhè.
ISA 60:22 Ezinaụlọ dị nta ga-aba ụba ghọọ obodo, mba nta ga-aghọ obodo buru ibu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ga-eme ka ha niile mezuo ọsịịsọ nʼoge ya.”
ISA 61:1 Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi, ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha, na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.
ISA 61:2 O zitere m ikwupụta afọ mgbe Onyenwe anyị ga-eji ihuọma leta ndị mmadụ, na ụbọchị ịbọ ọbọ nke Chineke anyị. O zitekwara m ịkasị ndị niile na-eru ụjụ obi,
ISA 61:3 na igboro ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn ihe na-akpa ha. O zitere m inye ha okpueze mara mma nʼọnọdụ ntụ, inye ha ọṅụ, nʼọnọdụ ịkwa akwa, na iyikwasị ha mmụọ otuto nʼọnọdụ mmụọ ịda mba. Nʼihi na Chineke akụọla ezi omume nʼime ha, dịka osisi ook siri ike, igosi ịma mma Onyenwe anyị.
ISA 61:4 Ha ga-ewugharịkwa ebe niile e tikpọrọ etikpọ nʼoge ochie, doziekwa ebe niile tọgbọrọ nʼefu site nʼoge dị anya; ha ga-eme ka obodo e tikpọrọ etikpọ dị ọhụrụ, bụ ebe tọgbọrọrị nʼefu nke ọtụtụ ọgbọ gara aga.
ISA 61:5 Ndị ọbịa ga-azụrụ gị igwe ewu na atụrụ unu; ndị mba ọzọ ga-akọrọ unu ala ubi unu, lekọtakwa ubi vaịnị unu niile.
ISA 61:6 A ga-akpọ unu ndị nchụaja Onyenwe anyị, kpọkwa unu ndị ozi Chineke anyị. A ga-eji akụ niile si na mba dị iche iche zụọ unu. Ọ bụkwa akụnụba ha ka unu ga-eji nyaa isi.
ISA 61:7 Nʼọnọdụ ihere dịịrị ha ugbu a, ndị m ga-enweta ngọzị okpukpu abụọ, nʼọnọdụ nkọcha dịịrị ha ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe nketa ha nwetara. Ha ga-enweta okpukpu ihe nketa ala abụọ, ketakwa ọṅụ nke ga-adịgidere ha ruo mgbe ebighị ebi.
ISA 61:8 “Nʼihi na mụ onwe m, Onyenwe anyị, na-ahụ ikpe ziri ezi nʼanya. Ma ana m akpọ izu ohi na ajọ omume niile asị. Aga m esite nʼikwesị ntụkwasị obi m kwụghachi ndị m nʼihi ahụhụ ha tara, mụ na ha ga-agbakwa ndụ ebighị ebi.
ISA 61:9 Mkpụrụ ha ga-abụ ndị a ma ama, a ga-asọpụkwara ha nʼetiti mba niile. Ndị niile hụrụ ha ga-amata, kwupụtakwa na ha bụ ndị Onyenwe anyị gọziri.”
ISA 61:10 Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị, mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m. Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m, werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ. Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja. E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma.
ISA 61:11 Dịka aja dị nʼubi si eme ka ihe a kụrụ nʼubi pupụta, dịka ubi a gbara ogige si eme ka mkpụrụ ubi too, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-esi mee ka ezi omume na otuto pupụta nʼihu mba niile.
ISA 62:1 Nʼihi Zayọn agaghị m emechi ọnụ, nʼihi Jerusalem agaghị m anọ jii, ruo mgbe ezi omume ya ga-enwuwa dịka ihe ụtụtụ; mgbe nzọpụta ya kwa ga-enwukwa dịka ọwaọkụ na-enwu enwu.
ISA 62:2 Mba niile ga-ahụ ezi omume gị. Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị. A ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ ahụ nke ọnụ Onyenwe anyị ga-agụ gị.
ISA 62:3 Ị ga-aghọ okpueze nke ịma mma nʼaka Onyenwe anyị, ihe iyi nʼisi nke ndị ụlọeze nʼaka Chineke gị.
ISA 62:4 A gakwaghị akpọ gị onye ahapụrụ ahapụ, maọbụ kpọọ ala gị ala tọgbọrọ nʼefu. Ma a ga-akpọ gị Hefziba, kpọkwa ala gị Beula, nʼihi na ihe gị ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, a ga-alụkwa ala gị dịka nwunye.
ISA 62:5 Dịka nwokorobịa si alụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, otu a ka Onye na-ewu gị ga-alụ gị, dịka onye lụrụ nwunye ọhụrụ sị aṅụrị ọṅụ nʼebe nwunye ọhụrụ ya nọ, otu a ka Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi gị.
ISA 62:6 Enyela m ndị nche ọnọdụ ọrụ nʼelu mgbidi gị niile, Jerusalem. Ha agaghị edebe ọnụ ha duu mgbe ọbụla, ma ehihie ma abalị. Unu ndị na-akpọku Onyenwe anyị, unu enyela onwe unu izuike.
ISA 62:7 Unu enyekwala ya izuike tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka Jerusalem guzosie ike, meekwa ya otuto nke ụwa niile.
ISA 62:8 Onyenwe anyị ewerela aka nri ya werekwa ogwe aka ya ṅụọ iyi sị, “Ọ dịghịkwa mgbe m ga-enye mkpụrụ ubi gị ka ọ bụrụ nri nye ndị iro gị ọzọ, ọ dịghịkwa mgbe ndị ọbịa ga-aṅụkwa mmanya ọhụrụ ahụ bụ nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ya.
ISA 62:9 Ma ndị were ya ka ihe ubi ga-eri ya, tookwa Onyenwe anyị, ndị kpokọtara oroma grepu ga-aṅụ ya nʼime ogige ebe nsọ m.”
ISA 62:10 Gabiganụ! Gabiganụ sitenụ nʼọnụ ụzọ ama niile. Dozienụ ụzọ maka ndị m. Wuzienụ ụzọ niile, wuzienụ okporoụzọ niile. Bupụsịanụ nkume niile, weliekwanụ ọkọlọtọ maka mba niile.
ISA 62:11 Onyenwe anyị ekwusaala okwu nye nsọtụ niile nke ụwa sị, “Gwanụ Ada Zayọn, ‘Lee Onye Nzọpụta gị na-abịa! Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, nkwụghachi nke ọ ga-akwụghachi sokwa ya na-abịa.’ ”
ISA 62:12 A ga-akpọ ha Ndị Nsọ, ndị Onyenwe anyị gbapụtara; a ga-akpọkwa unu ndị a na-achọsi ike, Obodo a na-agbakụtaghị azụ.
ISA 63:1 Onye bụ onye a si nʼEdọm na-abịa, onye si Bozra, nke uwe ya dị ọbara ọbara? Onye bụ onye a, yi uwe mara oke mma, onye na-azọ ije dịka ịba ụba nke ike ya si dị? “Ọ bu mụ onwe m, onye na-ekwu okwu nʼezi omume, onye dị ike ịzọpụta!”
ISA 63:2 Gịnị mere uwe gị ji na-acha ọbara ọbara, dịka uwe onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị?
ISA 63:3 “Azọchaala m ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị, naanị m zọchara ya; o nweghị onye sị na mba niile dị iche iche bịa nyere m aka. Azọchara m ha nʼiwe m, zọpịasịakwa ha nʼime oke ọnụma m; ọbara ha gbasasịrị nʼuwe m, ma metọsịa uwe m niile.
ISA 63:4 Nʼihi na ọ bụ ụbọchị m ji abọ ọbọ; afọ mgbapụta m kwadoro eruola.
ISA 63:5 Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka. O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka. Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri. Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya.
ISA 63:6 Nʼiwe m, azọpịara mba niile dị iche iche; esitere m nʼọnụma juru m obi zọpịasịa ha. Emekwara ka ọbara ndụ ha bụrụ ihe a wụsiri nʼala.”
ISA 63:7 Aga m ekwupụta ihe banyere ịhụnanya Onyenwe anyị. Aga m eto ya nʼihi ihe niile o mere. Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị mma ya nʼebe Izrel nọ, e, nʼihi ọtụtụ ihe ọma o mere nʼihi mmeso ọma niile o mesoro ụlọ Izrel, nke ọ na-emeso ha dịka obi ebere ya na ọmịiko ya si dị.
ISA 63:8 Nʼihi na Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a bụ nke m; e, ha agakwaghị agọnarị m ọzọ.” Ya mere, ọ ghọọrọ ha Onye nzọpụta.
ISA 63:9 Nʼime mkpagbu ha niile, a kpagbukwara ya onwe ya, ọ bụkwa mmụọ ozi nke ihu ya zọpụtara ha. Nʼime ịhụnanya ya na obi ebere ya, ọ gbapụtara ha, bulie ha elu, kuru ha ogologo ụbọchị ndị a niile ndị gara aga.
ISA 63:10 Ma ha nupuru isi megide ya, meekwa ka obi jọọ Mmụọ Nsọ ya njọ. Ọ bụ ya mere o ji ghọọ onye iro ha, lụsokwa ha ọgụ nʼonwe ya.
ISA 63:11 Mgbe ahụ, ndị ya chetara ụbọchị ndị ahụ gara aga, ụbọchị Mosis na ndị nke ya. Olee ebe onye ahụ nọ nke mere ka ha si nʼoke osimiri rigopụta, ya na onye ọzụzụ atụrụ nke igwe atụrụ ya? Olee ebe onye ahụ tinyere Mmụọ Nsọ ya nʼetiti ha nọ.
ISA 63:12 Olee onye ahụ ike ya mere ka osimiri kewaa abụọ nʼihu ha, mgbe Mosis weliri aka ya elu, meekwa ka aha ya dịgide ruo ebighị ebi?
ISA 63:13 Onye duuru ha gafee mmiri dị oke omimi? Dịka ịnyịnya na-agba ọsọ nʼọzara, ike agwụghị ha.
ISA 63:14 Dịka ehi na-ata ahịhịa na ndagwurugwu, Mmụọ Onyenwe anyị nyere ha izuike. Otu a ka i si duo ndị gị, ime ka aha gị bụrụ ihe a na-asọpụrụ asọpụrụ.
ISA 63:15 Onyenwe anyị, biko site nʼeluigwe, ebe obibi nsọ gị, lee anyị anya. Olee ebe nʼịnụ ọkụ nʼobi na ike gị dị? Olee ebe obi ebere gị na ọmịiko gị dịkwa?
ISA 63:16 Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị, a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị maọbụ Izrel agọnarị anyị, gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Nna anyị, onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie.
ISA 63:17 Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eme ka anyị si nʼụzọ gị kpafuo na-eme ka obi anyị sie ike otu a, na anyị adịghị atụ egwu gị? Lọghachi nʼihi ndị ohu gị, nʼihi ebo ndị ahụ bụ ihe nketa gị.
ISA 63:18 Ọ bụ naanị nwa oge nta ka ndị gị nwetara ebe nsọ gị, ma ugbu a, ndị iro anyị azọdala ebe nsọ gị.
ISA 63:19 Anyị bụ nke gị site na mgbe ochie, ma ị naghị achị nʼebe ha nọ, ha bụ ndị a na-akpọkwasịghịkwa aha gị.
ISA 64:1 Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala, ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị!
ISA 64:2 Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi, na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ. Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro gị niile maara aha gị, meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị.
ISA 64:3 Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị.
ISA 64:4 Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ, ọ dịbeghị ntị ghọtara, o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị, onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha.
ISA 64:5 Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka, bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha. Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha, iwe were gị. A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị?
ISA 64:6 Anyị niile dịka onye rụrụ arụ, ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi. Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi, mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe.
ISA 64:7 Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ; ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị. Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ, meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị.
ISA 64:8 Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite. Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.
ISA 64:9 Biko, Onyenwe anyị, anọgidela na-eweso anyị iwe; echetakwala mmehie anyị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Biko, lekwasị anyị anya nʼihi na ndị gị ka anyị bụ.
ISA 64:10 Obodo nsọ gị niile aghọọla ọzara; ọ bụladị Zayọn aghọọla ọzara, Jerusalem, ebe tọgbọrọ nʼefu.
ISA 64:11 Ụlọnsọ ukwu anyị ahụ mara mma, nke dịkwa nsọ, ebe nna anyị ha nọ too gị, ma feekwa gị ofufe, abụrụla ihe a gbara ọkụ. Ihe niile mara mma nʼime ya alaala nʼiyi.
ISA 64:12 Mgbe ihe niile gasịrị, Onyenwe anyị, ị ga-ejisi onwe gị ike? Ị ga-agba nkịtị, taa anyị ahụhụ ebe ọ gafere oke?
ISA 65:1 “Ana m egosipụta onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m. Ọ bụkwa ndị ahụ na-adịghị achọsi m ike na-achọta m. Ana m agwa mba ahụ nke na-adịghị akpọku aha m, asịrị m, ‘Lee m, anọ m nʼebe a.’
ISA 65:2 Ogologo ụbọchị niile ka m gbasapụrụ aka m abụọ nye ndị na-enupu isi, bụ ndị na-agbaso ụzọ na-ezighị ezi ndị a na-agbaso ihe ọbụla ha tụpụtara nʼuche ha,
ISA 65:3 ndị na-anọgide na-akpasu m iwe nʼihu m mgbe niile, ndị na-achụ aja nʼubi ha a gbara ogige, nʼebe ịchụ aja eji brik wuo,
ISA 65:4 ndị na-anọdụ nʼetiti ili, ma na-anọdụkwa ọnọdụ abalị nʼebe nzuzo dị iche iche; ndị na-eri anụ ezi, ndị ite ofe ha jupụtara nʼanụ na-adịghị ọcha;
ISA 65:5 ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso, nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’ Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m. Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị.
ISA 65:6 “Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị: Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju. E, aga m akwụghachi ha.
ISA 65:7 Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche, kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile. Aga m akwụghachi ha nʼuju, nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.”
ISA 65:8 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya, nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’ otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m; Agaghị m ebibicha ha niile.
ISA 65:9 Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta, sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile. Ndị m họpụtara ga-eketa ha, ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ.
ISA 65:10 Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ; Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi, na ndị m na-achọsi m ike.
ISA 65:11 “Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, ndị chezọrọ ugwu nsọ m, ndị na-edozi tebul maka Ihuọma, ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka.
ISA 65:12 Aga m eme ka unu zute mma agha; unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu. Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị; mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị. Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu, họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.”
ISA 65:13 Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “Ndị ohu m ga-eriju afọ, ma unu ga-anọ agụụ, akpịrị ga-akpọkwa unu nkụ, ma ha ga-aṅụ mmiri. Unu ga-anọ nʼọnụma na ihere, ma ha ga-anọ nʼọṅụ.
ISA 65:14 Ndị ohu m ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ nke jupụtara nʼobi ha, ma unu ga-akwa akwa, nʼihi ihe mgbu nke obi unu, tiekwa mkpu akwa nʼihi obi ntiwa nke mmụọ unu.
ISA 65:15 Unu ga-ahapụ aha unu nye ndị m họpụtara nye onwe m ka ọ bụrụ ihe ha ji abụ ọnụ; nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-etigbu unu, ma ọ ga-akpọ ndị ohu ya aha ọzọ.
ISA 65:16 Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ, ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu, onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụ ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu. Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga, zokwa ha site nʼanya m.
ISA 65:17 “Nʼihi na lee, ana m eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ; ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla.
ISA 65:18 Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke, nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ.
ISA 65:19 Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem, nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m; a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ, maọbụ olu iti mkpu akwa.
ISA 65:20 “Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu ga-adị nʼebe ahụ ọzọ, a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya; nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ dị ka nwantakịrị; a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ dịka onye a bụrụ ọnụ.
ISA 65:21 Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya; ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha.
ISA 65:22 Ndị m agaghị ewukwa ụlọ hapụrụ ya ndị ọzọ, maọbụ ghaa mkpụrụ nʼubi nke ndị ọzọ ga-aghọrọ rie. Nʼihi na dịka osisi si adị ndụ ogologo oge otu a ka ndị m ga-esi dịkwa ndụ ogologo oge. Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihe ahụ ha ji aka ha rụpụta.
ISA 65:23 Ha agaghị adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ha agaghị amụtakwa ụmụ ndị ga-emesịa nwụchuo ọnwụ. Nʼihi na ha ga-abụ ndị Onyenwe anyị gọziri, ha na ụmụ ụmụ ha.
ISA 65:24 Tupu ha akpọkuo m, aga m aza ha. Mgbe ha ka nọ na-agwa m banyere mkpa ha, aga m anụ, zakwa ekpere ha.
ISA 65:25 Nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-atakọ nri nʼotu ebe, ọdụm ga-ata ahịhịa dịka ehi, ma agwọ ọjọọ niile ga-ata aja! Ha agaghị emerụ ihe ọbụla ahụ, maọbụ bibie ihe ọbụla nʼugwu nsọ m.” Ka Onyenwe anyị kwuru.
ISA 66:1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ọ bụ ụdị ụlọ gịnị ka ị ga-ewuru m? Ebee ka ebe izuike m ga-adị?”
ISA 66:2 Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile, mee ka ha ji dịrị? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ, ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu, ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m.
ISA 66:3 Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehi dịka nwoke na-egbu mmadụ, onye ọbụla jikwa nwa atụrụ achụ aja dị ka onye na-agbaji nkịta olu, onye ọbụla na-achụ aja mkpụrụ ọka dị ka onye na-eche ọbara ezi, otu a kwa, onye ọbụla na-esure ụda na-esi isi ụtọ nke ncheta dị ka onye na-efe arụsị. Ha ahọpụtarala onwe ha ụzọ nke ha, ha na-enwekwa mmasị nʼihe arụ ha niile.
ISA 66:4 Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu, mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha. Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị, mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị. Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m, họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.”
ISA 66:5 Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-ama jijiji nʼokwu ya, “Ụmụnna unu, ndị kpọrọ unu asị, ndị chụpụkwara unu nʼihi aha m, ekwuola sị, ‘Ka a sọpụrụ Onyenwe anyị! Ka anyị lee ụdị ọṅụ ga-abụ nke unu!’ Ma a ga-etinye ha nʼọnọdụ ihere.
ISA 66:6 Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo? Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị? Ọ bụ ụzụ Onyenwe anyị na-eme. Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha.
ISA 66:7 “Tupu ime amalite ime ya, ọ mụpụtalarị nwa ya. Tupu ihe mgbu ya ebido, ọ mụpụtala nwa nwoke.
ISA 66:8 Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ? Onye kwa ji anya ya hụ ihe dị otu a? A pụrụ ịmụpụta otu mba nʼotu ụbọchị? Ka e nwere ike ime ka otu obodo malite ịdị nʼotu ntabi anya? Lee na tupu ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ya ebido Zayọn amụpụtala ụmụ ya.
ISA 66:9 Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụ gharakwa ime ka a mụọ ya?” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “M ga-emechi akpanwa mgbe m na-eme ka a mụpụta ya?” ka Chineke gị jụrụ.
ISA 66:10 “Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ, unu ndị niile hụrụ ya nʼanya; soronụ ya ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, unu ndị ruru ụjụ nʼihi ya.
ISA 66:11 Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ. Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ, ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọ mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.”
ISA 66:12 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri, mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke. Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya, wugharịakwa gị nʼikpere ya.
ISA 66:13 Dịka nne si akasị nwa ya obi, otu a ka m ga-esi kasịe unu obi. Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.”
ISA 66:14 Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ, ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ; a ga-emekwa ka aka Onyenwe anyị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ, ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya.
ISA 66:15 Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa. Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe. Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya, werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba.
ISA 66:16 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eji ọkụ na mma agha ya kpee ndị mmadụ niile ikpe. Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ.
ISA 66:17 “Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
ISA 66:18 “Ma mụ onwe m, amaara m nke ọma ihe ha zubere ma meekwa, ana m abịa ịchịkọta mba niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha niile ga-abịakwa hụ ebube m.
ISA 66:19 “Aga m edokwa ihe ịrịbama nʼetiti ha, zipụkwa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ha ka ha gaa nʼobodo Tashish, na Libiya, na Lidiya (ndị na-agba àkụ nʼụta nke ọma) na Tubal, na Griis. E, ha ga-eje na mba niile nke dị anya, nʼofe osimiri, ebe ndị bi nʼime ya na-anụbeghị ihe banyere ịdị ukwuu nke m, maọbụ hụ ebube m. Ha ga-ekwusakwa ihe banyere ebube m nʼetiti mba niile dị iche iche.
ISA 66:20 Ha ga-akpọghachi ụmụnne unu niile site na mba niile, bịa nʼugwu nsọ m dị na Jerusalem, dịka onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị. Ha ga-ebute ha nʼelu ịnyịnya, nʼụgbọ agha, nʼelu ụgbọala a na-adọkpụ adọkpụ, nʼelu ịnyịnya muul na nʼelu ịnyịnya kamel,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ha ga-ebubata ha dịka mgbe ndị Izrel na-ewebata onyinye mkpụrụ ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼefere mmemme dị ọcha.
ISA 66:21 Aga m ahọrọkwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị,” ka Onyenwe anyị kwuru.
ISA 66:22 “Dịka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ nke m ga-eke ga-esi dịgide nʼihu m, otu a ka aha unu na agbụrụ unu ga-adịgide, ka Onyenwe anyị kwubiri.
ISA 66:23 Ọ ga-abụkwa na site nʼotu Ọnwa ọhụrụ ruo nke ọzọ, sitekwa nʼotu ụbọchị izuike ruo na nke ọzọ ya, anụ ahụ niile bụ mmadụ ga-abịa, daa, kpọọ isiala nʼihu m,” ka Onyenwe anyị kwuru.
ISA 66:24 “Ha ga-apụ, jee, lekwasị ozu ndị ahụ niile nwụrụ anwụ anya, bụ ndị ahụ niile nupuru isi megide m. Nʼihi na ikpuru ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ a kwanyere agakwaghị anyụ anyụ. Ha ga-abụkwara mmadụ niile ihe na-asọ oyi.”
JER 1:1 Ndị a bụ okwu Jeremaya nwa Hilkaya, bụ otu onye nʼime ndị nchụaja, nọ nʼAnatot nke dị nʼala Benjamin.
JER 1:2 Onye okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere nʼafọ nke iri na atọ nʼoge ọchịchị Amọn, eze Juda bụ nwa Josaya.
JER 1:3 Ozi ndị ọzọ rukwara ya ntị nʼoge Jehoiakim nwa Josaya, bụ eze Juda, ruokwa nʼọnwa nke ise nʼafọ nke iri na otu nke Zedekaya nwa Josaya, bụ eze Juda kwụsịrị, mgbe a dọkpụụrụ ndị Jerusalem nʼagha buru ha ka ha gaa biri na mba ọzọ.
JER 1:4 Okwu Onyenwe anyị bịakwutere m, na-asị,
JER 1:5 “Amaara m gị tupu a tụrụ ime gị, tupu a mụọ gị, edoro m gị nsọ, ahọpụtakwara m gị dịka onye amụma nye mba niile.”
JER 1:6 Asịrị m, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Lee, amaghị m ekwu okwu. Abụ m naanị nwantakịrị.”
JER 1:7 Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Asịkwala ‘Abụ m naanị nwantakịrị,’ nʼihi na ị ga-agakwuru onye ọbụla m zigara gị, ị ga-ekwukwa ihe niile m nyere gị nʼiwu.
JER 1:8 Atụkwala egwu nʼihi ha, nʼihi na mụ onwe nọnyere gị ịnapụta gị,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 1:9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya metụ m nʼọnụ, sị m, “Lee, ewerela m okwu m tinye gị nʼọnụ.
JER 1:10 Lee, taa, ana m eme gị onye nlekọta mba dị iche iche na alaeze niile, ihopu na ikwada, ịla nʼiyi na ịtịkpọkwa ha, i wulite ma kụọkwa.”
JER 1:11 Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m, na-asị, “Jeremaya, gịnị ka ị na-ahụ?” Azara m sị, “Ana m ahụ otu alaka osisi alụmọnd.”
JER 1:12 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ị hụrụ nke ọma, nʼihi na m na-eche okwu ọnụ ịhụ m na m mezuru ha.”
JER 1:13 Okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ na-asị, “Gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m, “Ana m ahụ ite mmiri ọkụ, nke na-agbọ agbọ, nke e mere ka o hulata chee ọnụ ya na ndịda.”
JER 1:14 Onyenwe anyị sịrị m, “Ihe egwu ga-esite nʼugwu bịakwasị ndị niile bi nʼala a.
JER 1:15 Ma ugbu a, ana m akpọku ndị niile bi nʼalaeze dị nʼugwu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Ndị eze ha ga-abịa doo ocheeze ha nʼọnụ ụzọ ama e si abata Jerusalem, imegide ogologo mgbidi nke obodo ahụ gburugburu, na imegidekwa obodo niile nke Juda.
JER 1:16 Aga m ekwupụta ikpe niile m megide ha, nʼihi ajọ omume ha niile nʼịgbakụta m azụ, na isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, nakwa ịkpọ isiala nye ihe ndị ahụ niile ha ji aka ha kpụọ.
JER 1:17 “Bilie ọtọ, jikere onwe gị, ka ị pụọ gaa gwa ha ihe ọbụla m nyere gị nʼiwu. Atụkwala ụjọ ha, ma ọ bụghị ya, aga m emenye gị egwu nʼihu ha.
JER 1:18 Nʼihi na lee, site taa gaa nʼihu emeela m gị ka ị dịrị ka obodo e wusiri ike. Ị dịkwa ka mgbidi e ji igwe kpụọ, na dịka ibo e ji ọla dị arọ kpụọ, iguzogide ala ahụ niile. Iguzogide ndị eze Juda niile, ndịisi ala Juda niile, na ndị nchụaja niile, na ndị mmadụ ọzọ.
JER 1:19 Ha ga-agbalị ka ha megide gị, ma ha agaghị emeri gị. Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m anapụtakwa gị.” Otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
JER 2:1 Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m na-asị,
JER 2:2 “Gaa, kwupụta na ntị Jerusalem, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Echetara m ịnụ ọkụ nʼobi nke okorobịa gị nʼoge gara aga ime ihe ga-atọ m ụtọ, ịhụnanya gị dịka onye a lụrụ ọhụrụ, echetakwara m otu unu si soro m nʼime ọzara, ga nʼala tọgbọrọ nʼefu nke a na-akụghị mkpụrụ.
JER 2:3 Izrel bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị, mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ya. Ndị niile ripịara ya ka a gụrụ dị ka ndị ikpe mara. Ihe ọjọọ dakwasịkwara ha.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 2:4 Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị unu ụlọ Jekọb, na unu ndị bụ agbụrụ niile sitere nʼIzrel.
JER 2:5 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nna unu ha chọpụtara nʼime m, mere ha ji si nʼebe m nọ kpafuo, nọrọ m ebe dị anya? Nke mere na ha ghọrọ ndị nzuzu site nʼịgbaso arụsị?
JER 2:6 Ha ajụghị ‘Olee ebe Onyenwe anyị ahụ nọ, bụ onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta anyị, duuru anyị gafee ọzara tọgbọrọ nʼefu, nʼala ọzara na ala olulu jupụtara, ala nke akpịrị ịkpọ nkụ na nke oke ọchịchịrị, ala ebe ọ dịghị onye na-esi na ya agafee na nke mmadụ na-ebighị na ya?’
JER 2:7 Ọ bụ m kpọbatara unu nʼala na-amị ọtụtụ mkpụrụ, ka unu rie ihe dị ukwuu na ihe dị mma si nʼime ya. Ma unu bara merụọ ala m unu mere ihe nketa m ka ọ ghọọ ihe arụ.
JER 2:8 Ndị nchụaja ajụghị sị, ‘Olee ebe Onyenwe anyị nọ?’ Ndị ikpe ha amaghị m, ndị na-achị ha mehiere megide m, ndị amụma ha bụkwa aha Baal ka ha ji ebu amụma, ha gbasooro ihe na-enweghị isi.
JER 2:9 “Nʼihi ya, aga m ebulite ebubo megide unu,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “M ga-ebulikwa ebubo megide ụmụ ụmụ unu.
JER 2:10 Gafee nʼọnụ mmiri Saiprọs lee anya, zie ozi gaa Keda ma leruo anya nke ọma, ma ị ga-ahụ ihe ọbụla yiri nke a.
JER 2:11 O nwerela mba gbanwere chi ndị ha na-efe? (Ọ bụ ezie na ha abụghị chi.) Ma ndị m ewerela arụsị na-enweghị isi gbanwere ebube ha.
JER 2:12 Ka ibubo nwụọ gị, gị eluigwe nʼihi nke a, maa jijiji, tụọkwa oke ụjọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 2:13 “Nʼihi na ndị m emeela ihe ọjọọ abụọ. Ha agbakụtala m azụ, bụ Isi iyi mmiri ndụ, gwuoro onwe ha ebe ichebe mmiri nke tipuru etipu na-enweghị ike ịnagide mmiri ọbụla.
JER 2:14 Izrel ọ bụ ohu, ka ọ bụ ohu a mụrụ nʼụlọ? Gịnị mere o ji ghọọ ihe nlụta nʼagha?
JER 2:15 Ọdụm agbọọla ụja, ha ebigbọọla meekwa ka ọ nụ olu ha. Ha ebibiela obodo ya laa ya nʼiyi, suo ya ọkụ, nke mere na o nweghị onye bi na ha.
JER 2:16 Ọzọkwa, ndị ikom Memfis na Tapanhis a kupuola gị isi.
JER 2:17 Ọ bụghị unu onwe unu wetaara onwe unu ihe ọjọọ dị otu a site na ịhapụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, mgbe ọ na-edu unu na-aga nʼụzọ?
JER 2:18 Ugbu a, gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Ijipt sitekwa nʼịṅụ mmiri nke osimiri Naịl? Gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Asịrịa, sitekwa nʼịṅụ mmiri si na Yufretis?
JER 2:19 Ọ bụ ajọ omume unu ga-ewetara unu ahụhụ; ahụhụ soo ndaghachi azụ unu bụ ihe ga-adọ unu aka na ntị. Tulee ma matanụ nʼonwe unu otu o si bụrụ ihe ọjọọ na ihe ilu nye unu bụ inupu isi na ịgbakụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu azụ na-enweghị egwu ọbụla nʼime unu banyere m,” nke a bụ ihe Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kwupụtara.
JER 2:20 “Nʼoge gara aga, unu gbajiri yoku unu dọkapụ agbụ jikọtara mụ na unu, unu sịrị, ‘Agaghị m ejere gị ozi.’ Nʼezie, ọ bụ nʼelu ugwu ọbụla nakwa nʼokpuru osisi na-agbasa agbasa, ka ị na-edina dịka onye akwụna.
JER 2:21 Ma mụ onwe m kụrụ gị dịka osisi vaịnị kachasị mma nke mkpụrụ ya dị ndụ dịkwa mma. Olee otu i siri tụgharịa megide m, ghọọ ihe rụrụ arụ, osisi vaịnị ọhịa?
JER 2:22 Nʼagbanyeghị na iji ncha sachaa onwe gị, maọbụ jirikwa ọtụtụ ntụ ncha, ntụpọ nke mmehie gị ka dị nʼihu m,” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 2:23 “Ị ga-esi aṅaa na-asị, ‘A bụghị m onye e merụrụ emerụ; o nwebeghị oge ọbụla m ji gbaso Baal?’ Leruo ụzọ gị anya na ndagwurugwu, tulee ihe ndị i mere. Ị bụ nne ịnyịnya ibu dị nkọ, na-agbagharị ebe a nʼebe nke ọzọ.
JER 2:24 Nne ịnyịnya ibu ọhịa nke mara ụzọ ya nke ọma nʼọzara, na-esi imi ma ọ ga-esichapụta oke ịnyịnya ibu, onye pụrụ igbochi ya nʼoge mmekọ ya na oke ịnyịnya zuru? Oke ịnyịnya ọbụla chọọrọ ya agaghị atụfu oge nʼịchụgharị ya, nʼihi nʼoge ha chọrọ mmekọ, ha ga-achọta ya.
JER 2:25 Agbala ọsọ ruo mgbe ị ga-agbara ụkwụ efu, mgbe akpịrị ga-akpọ gị nku. Ma ị na-asị, ‘O nweghị uru ọ bara. Nʼihi na ahụrụ m chi ndị mba ọzọ nʼanya, aghaghị m ịgbaso ha.’
JER 2:26 “Dịka a na-eme onye ohi ihe ihere mgbe e jidere ya, otu a ka a ga-eme ụlọ Izrel ihere, ha onwe ha, ma ndị eze ha, ma ndịisi ha, ndị nchụaja ha na ndị amụma ha.
JER 2:27 Ha na-asị osisi, ‘Nna m ka ị bụ,’ na-asịkwa nkume, ‘Ọ bụ gị mụrụ m.’ Ha agbakụtala m azụ, jụ iche m ihu. Ma mgbe ọbụla nsogbu bịakwasịrị ha, ha na-asị, ‘Bịa, zọpụta anyị.’
JER 2:28 Olee ebe chi ndị ahụ i meere nye onwe gị nọ? Ka ha bịa, ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịzọpụta gị, mgbe nsogbu bịakwasịrị unu. Nʼihi na gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dịka i si nwee ọtụtụ obodo.
JER 2:29 “Gịnị mere unu ji ekwu okwu ebubo megide m? Unu niile enupula isi megide m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 2:30 “Nʼefu ka m tiri ụmụ unu ihe; ma nke a emeghị ka ha nabata ịdọ aka na ntị. Dịka ọdụm na-adọgbu anụ, mma agha unu eripịala ndị amụma unu.
JER 2:31 “Unu ndị ọgbọ a, tuleenụ okwu nke Onyenwe anyị: “O nweela mgbe m bụ ọzara nye ndị Izrel ma ọ bụkwanụ ala gbara oke ọchịchịrị? Gịnị mekwaranụ ndị m ji na-asị, ‘Anyị enwerela onwe anyị ịwagharị, anyị agaghị abịakwutekwa gị ọzọ’?
JER 2:32 Nwaagbọghọ ọ na-echefu ọla ịchọ mma ya, nwanyị a na-alụ ọhụrụ ọ na-echefu ngwa ịchọ mma ya? Ma nʼime ọtụtụ ụbọchị nke a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị m echefuola m.
JER 2:33 Lee ka unu si bụrụ ndị ọka nʼịgbaso ịhụnanya. Ọ bụladị ụmụ nwanyị dị njọ karịsịa nwere ike ịmụta ihe site nʼụzọ unu.
JER 2:34 Nʼuwe unu ka achọtara ọbara ndị ogbenye na-enweghị ihe ọjọọ ha mere, nʼagbanyeghị na unu ejideghị ha ka ha nʼagbaka ụzọ. Ma unu gara nʼihu
JER 2:35 na-asịkwa, ‘Emeghị m ihe ọjọọ, ọ dịghị eweso m iwe.’ Ma aga m ekpe unu ikpe, nʼihi na unu na-asị, ‘Emeghị m mmehie.’
JER 2:36 Gịnị mere unu ji na-akpagharị na-agbanwe ụzọ unu ọtụtụ mgbe? Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ ihere dịka ndị Asịrịa mere unu.
JER 2:37 Unu ga-ebu aka unu nʼisi mgbe unu si ebe ahụ na-apụ, nʼihi na Onyenwe anyị ajụla ndị ahụ unu tụkwasịrị obi. Ha agaghị enyere unu aka.
JER 3:1 “Ọ bụrụ na nwoke agbaara nwunye ya alụkwaghị m, nwanyị ahụ ahapụ ya pụọ ga lụrụ nwoke ọzọ, di mbụ ya ahụ, o kwesiri ịlaghachi ka ọ lụọkwa ya ọzọ? Ọ bụ na agaghị emerụ ala ahụ nke ukwuu? Ma unu ebiela ndụ dịka ndị akwụna nwere ọtụtụ ndị iko, ọ bụ ugbu a ka unu ga-alaghachikwute m?” otu ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 3:2 “Welie anya gị abụọ ma lee ebe niile nke dị elu nke ọhịa na-adịghị nʼala a, olee ebe gị na ndị ikom na-edinakọbeghị nʼịkwa iko? Ị na-anọ nʼakụkụ ụzọ niile na-eche ndị iko, na-anọkwa dịka onye Arebịa nʼọzara. Ị werela ịkwa iko gị niile na ihe ọjọọ gị merụọ ala a.
JER 3:3 Ọ bụ nke a mere mmiri ji kwụsị izokwara unu, ọbụla dị mmiri nke na-ezo nʼoge ọkọchị. Nʼihi na unu bụ ndị akwụna, ndị ihere na-adịghị eme.
JER 3:4 Ọ dịbeghị anya mgbe unu kpọrọ m, sị m, ‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m dị na nwantakịrị.
JER 3:5 Iwe gị ọ ga-adịgide mgbe niile? Iwe gị dị ọkụ ọ ga-adịgide ebighị ebi?’ Otu a ka unu si ekwu okwu, ma unu nọgidesịrị ike na-eme ihe ọjọọ niile unu nwere ike ime.”
JER 3:6 Ozi a, nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta, rutere m aka nʼoge eze Josaya na-achị. Lee ihe ọ gwara m. “Ị hụla ihe Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eme? Ọ gaala nʼelu ugwu ọbụla dị elu nakwa nʼokpuru osisi ndụ ọbụla, na-akwa iko nʼebe ahụ.
JER 3:7 Echere m na mgbe o mesịrị ihe ndị a niile na ọ ga-alọghachikwute m, ma ọ lọtaghị. Nwanne ya nwanyị bụ Juda, onye na-ekwesighị ntụkwasị obi hụkwara ya.
JER 3:8 Enyere m Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi akwụkwọ alụkwaghị m, chụpụ ya nʼihi ndụ ịkwa iko ya, ma lee na nwanne ya nwanyị onye na-ekwesịkwaghị ntụkwasị obi bụ Juda atụghị egwu. Ọ gakwara nʼihu ịkwa iko.
JER 3:9 Ma nke a emeghị ka ihere mee ya. O merụọla ala, ọ na-akwakwa iko site nʼife nkume na osisi.
JER 3:10 Nʼagbanyeghị nke a, nwanne ya nwanyị nke na-ekwesighị ntụkwasị obi, bụ Juda ejighị obi ya lọghachikwute m, maọbụ naanị nlọghachi aghụghọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 3:11 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Izrel na-adaghachi azụ na-egosi onwe ya nʼonye ezi omume karịa Juda onye na-aghọ aghụghọ.
JER 3:12 Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị, “ ‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ, nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.
JER 3:13 Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara, na i nupula isi megide Onyenwe anyị, bụ Chineke gị. Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche nʼokpuru osisi ndụ niile, na ị jụkwara irubere m isi.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 3:14 “Lọghachinụ unu ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, “nʼihi abụ m di unu. M ga-ahọrọ unu, otu onye site nʼotu obodo na mmadụ abụọ site nʼotu agbụrụ. M ga-akpọghachi unu Zayọn.
JER 3:15 Mgbe ahụ, aga m enye unu ndị ọzụzụ atụrụ masịrị m, ndị ga-eji amamihe na nghọta duo unu.
JER 3:16 Nʼụbọchị ahụ, mgbe ọnụọgụgụ unu mụbara dị ukwuu nʼala ahụ,” otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ndị mmadụ agaghị asịkwa ọzọ, ‘igbe ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị.’ Ọ gaghị abakwa ha nʼobi maọbụ ha echeta ya; ọ gaghị adịkwa ha mkpa maọbụ emepụtakwa ọzọ.
JER 3:17 Mgbe oge ahụ ruru, aha a ga-akpọ Jerusalem bụ Ocheeze Onyenwe anyị. Mba niile kwa ga-ezukọta nʼebe ahụ ife m ofufe. Ha agakwaghị agbaso echiche obi ọjọọ ha.
JER 3:18 Nʼụbọchị ahụ ndị Juda ga-adịnyere ndị Izrel, ha abụọ ga-ejikọta aka site nʼala ahụ dị nʼugwu bịa nʼala nke m nyere nna nna unu dịka ihe nketa.”
JER 3:19 “Mụ onwe m kwuru sị, “ ‘Lee ka ọ ga-esi masị m imeso unu mmeso dịka unu bụ ụmụ m ndị ikom, nye unu ala dị mma nke ga-ewetara unu ọṅụ, nke bụ ihe nketa kachasị mma na mba niile.’ Ana m eche na unu ga-akpọ m ‘Nna’ ma hapụ iwezuga onwe unu site nʼịgbaso m.
JER 3:20 Ma dịka nwunye na-ekwesighị ntụkwasị obi, i gosila onwe gị, O Izrel na ị bụ onye a na-ekwesighị ịtụkwasị obi” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 3:21 A na-anụ ụzụ mkpu akwa nʼelu ugwu. Ọ bụ ụzụ akwa ụmụ Izrel ndị na-arịọ arịrịọ nʼihi na ha ebiela ndụ mmehie; ha echefuokwala Onyenwe anyị bụ Chineke ha.
JER 3:22 “Lọghachinụ, unu bụ ndị na-adaghachi azụ. Mụ onwe m ga-agwọ unu ndaghachi azụ unu.” Ma unu na-aza sị, “E, anyị na-alọghachikwute gị nʼihi na gị onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị.
JER 3:23 Nʼezie, aghụghọ, ka mkpọtụ ofufe nke arụsị niile, nʼelu ugwu nta dị iche iche na nʼelu ugwu niile bụ, nʼezie, nʼime Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ka nzọpụta Izrel dị.
JER 3:24 Ma site mgbe anyị dị na nwantakịrị, ihe ihere ahụ eripịala mkpụrụ sitere na ndọgbu nʼọrụ nke nna nna anyị ha igwe anụ ụlọ na ehi ha, ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom.
JER 3:25 Ka anyị dinara ala nʼihere anyị, ka ọnọdụ oke ihere dịrị anyị kpuchikwa anyị. Anyị na nna nna anyị ha emehiela megide Onyenwe anyị Chineke anyị; site mgbe anyị dị na nwantakịrị ruo taa o nwebeghị mgbe anyị ji rube isi ime ihe Onyenwe anyị Chineke anyị nyere nʼiwu.”
JER 4:1 “Ọ bụrụ na unu bụ Izrel, ga-alọta, ka Onyenwe anyị kwubiri, mụ ka ị ga-alọghachikwute,” “Ọ bụrụ na unu ewezuga arụsị ndị ahụ rụrụ arụ site nʼihu m, hapụ isi ebe m nọ kpafuo,
JER 4:2 ọ bụrụkwa na unu ga-eji eziokwu, ikpe ziri ezi na ụzọ ezi omume ṅụọ iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ mgbe ahụ mba niile ga-agọzi onwe ha site na ya nyakwaa isi nʼime ya.”
JER 4:3 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-agwa ndị Juda na Jerusalem sị, “Kọzeenụ ala ubi unu nke unu na-akọbeghị; unu akụnyela mkpụrụ ubi unu nʼetiti ogwu.
JER 4:4 Bienụ onwe unu ugwu nye Onyenwe anyị, biekwanụ mkpụrụobi unu ugwu, unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem ma ọ bụghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu dịka ọkụ, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere, ọ ga-ere ma ọ dịkwaghị onye ga-emenyụ ya.
JER 4:5 “Kwupụta ya na Juda, kwusaa ya na Jerusalem sị, ‘Fụọnụ opi nʼala ahụ niile.’ Tienụ mkpu nʼụzọ mmadụ ga-aghọta ya. Gwanụ ndị Juda na Jerusalem ka ha zukọtaa gbaga nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike.
JER 4:6 Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga Zayọn! Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge! Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibi na ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.”
JER 4:7 Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta, ka onye a na-ebibi mba niile si abịa. Ọ hapụla ebe obibi ya, na-abịa ịla Juda nʼiyi. Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda, ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha.
JER 4:8 Ya mere, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe; kwaanụ akwa, tiekwanụ mkpu akwa, nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị esitebeghị nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya.
JER 4:9 “Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba; ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja, otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.”
JER 4:10 Mgbe ahụ ekwuru m sị; “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee na ị ghọgbuola ndị a na Jerusalem site na ị sị, ‘Unu ga-enwe udo,’ mgbe mma agha dị anyị nʼolu.”
JER 4:11 Nʼoge ahụ, a ga-agwa ndị a na Jerusalem, “Ifufe dị ọkụ, nke sitere nʼebe dị elu ihe na-adịghị si nʼọzara na-efebata irute ndị m. Ma ọ bụghị ifufe maka ịfụcha, maọbụ ime ka adị ọcha,
JER 4:12 ọ bụ ifufe nke dị oke ike karịa nke na-esite na mụ. Ugbu a, ana m ekwupụta okwu ikpe m megide ha.”
JER 4:13 Lee anya, ha na-abịa dịka igwe ojii. Ụgbọala agha ya na-abịa dịka oke ifufe, ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo. Ahụhụ dịrị anyị, anyị abụrụla ndị e bibiri ebibi! Anyị abụrụla ndị na-aga ịla nʼiyi!
JER 4:14 Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị. Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi?
JER 4:15 Otu olu na-akpọsa site na Dan, ọ na-akpọsa ịla nʼiyi site nʼugwu niile nke Ifrem.
JER 4:16 “Gwa mba niile otu a, ha abịala, kpọsaa banyere Jerusalem: ‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya, na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda.
JER 4:17 Ha ga-agbakwa Jerusalem gburugburu dịka ndị agha na-eche ubi a gbara ogige nche, nʼihi na ndị bi nʼime ya enupula isi megide m,’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
JER 4:18 “Ụzọ gị na omume gị niile buteere gị ihe ndị a. Nke a bụ ntaramahụhụ gị. Lee ka o si dị ilu! Lee ka o si emibanye nʼime obi.”
JER 4:19 Ihe mgbu a dị ukwuu. Lee na apụghị m ịnagide ya. Obi m o, obi m o! Lee ka obi m si ada m gbim gbim gbim. Apụghịkwa m ịnọ jụụ. Ana m anụ ụda opi ike, na-anụkwa ụzụ agha.
JER 4:20 Mbibi na-arị mbibi ibe ya elu, lee na a laala ala a niile nʼiyi. Na mberede, e bibiela ụlọ ikwu anyị niile; a dọkasịkwala akwa mgbochi ha niile.
JER 4:21 Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-ahụ ọkọlọtọ agha ndị a a na-alụ? Ruo ole mgbe kwa ka m ga-anọgide na-anụ ụda opi ike?
JER 4:22 “Ndị m bụ ndị nzuzu, ha amaghị m. Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche, ha enweghị nghọta ọbụla. Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume, ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.”
JER 4:23 Elere m anya nʼụwa hụ na ọ bụ ihe tọgbọrọ nʼefu, leekwa anya na mbara eluigwe, ma o nweghị ìhè dị ya.
JER 4:24 Elere m anya nʼugwu ukwu, hụ na ha na-ama jijiji, leekwa anya nʼugwu nta, hụ na ha na-aṅagharị aṅagharị.
JER 4:25 Elere m anya ma ahụghị mmadụ ọbụla, ụmụ nnụnụ niile dị na mbara eluigwe efefusịala.
JER 4:26 Ala ọma ahụ aghọọla ọzara, obodo niile aghọọla mkputamkpu ebe nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu oke iwe ya.
JER 4:27 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “A ga-ebibi ala ahụ niile, ma agaghị m ebibicha ya kpamkpam.
JER 4:28 Ụwa ga-eru ụjụ, mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị. Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m. Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.”
JER 4:29 Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo ha mgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso. Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa; ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu. Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu.
JER 4:30 Gịnị bụ nke a, gị onye na-enweghị olileanya? Gịnị mere unu ji yiri uwe uhie, were ọlaolu ọlaedo dị oke ọnụ yiri nʼolu? Gịnị mere unu ji were ihe ịchọ mma tee nʼanya unu? Nʼefu ka unu na-eme onwe unu ka unu dị mma. Ndị iko unu na-elelị unu; ndụ unu ka ha na-achọkwa.
JER 4:31 Ana m anụ olu iti mkpu akwa nke yiri olu akwa nwanyị ime na-eme, ọ dị ka ude nwanyị na-agbalị ịmụpụta nwa mbụ ya. Ma olu akwa m nụrụ bụ nke ada Zayọn, ebe ọ nọ na-eku ume ike ike. Ọ dara nʼala gbasapụ aka ya, ma na-akwa akwa na-asị, “Onye nwụrụ anwụ ka m bụ! Lee, ndụ m ka e nyere ndị ogbu mmadụ.”
JER 5:1 “Jegharịa nʼokporoụzọ niile dị na Jerusalem, legharịa anya, ma mara, chọkwanụ gburugburu nʼama ya niile. Ma unu ọ ga-achọpụta otu onye, bụ onye na-eme ihe ziri ezi, na onye na-achọ eziokwu. M ga-agbagharakwa obodo a
JER 5:2 Ọ bụ ezie, na ha na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ ma ha ka na-aṅụ iyi nʼokwu ụgha.”
JER 5:3 Onyenwe anyị, anya gị abụọ ọ bụghị eziokwu ka ọ na-achọ? Ị tiela ha ihe, ma o metụghị ha nʼahụ. I gwepịara ha, ma ha ekweghị a nabata ịdọ aka na ntị. Ha emeela ka ihu ha sie ike karịa nkume, ha ajụla ịchịgharị.
JER 5:4 Mgbe ahụ, a sịrị, “Ndị a bụ naanị ndị ogbenye na ndị na-enweghị uche, ha amaghị ihe ọbụla gbasara ụzọ Onyenwe anyị, na iwu nke Chineke ha.
JER 5:5 Aga m ejekwuru ndị ndu, gwa ha okwu sị, nʼezie ha maara ihe gbasara ụzọ Onyenwe anyị, marakwa iwu niile nke Chineke ha.” Ma ha onwe ha nʼotu obi agbajiela ịyagba ahụ, tijiekwa agbụ niile.
JER 5:6 Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ; nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha. Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta. Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu, na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu.
JER 5:7 “Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu? Lee na ụmụ unu ahapụla m, na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi. Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha, ma ha nọgidere na-akwa iko. Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ.
JER 5:8 Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya. Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya.
JER 5:9 Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị, m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ megide mba dị otu a?”
JER 5:10 “Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya, ma unu emebila ya kpamkpam. Gbajisienụ alaka ya nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị.
JER 5:11 Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda egosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 5:12 Ha ekwuola okwu ụgha megide Onyenwe anyị. E, ha ekwuola sị, “O nweghị ihe Ọ ga-eme! Ihe ọjọọ ọbụla agaghị adakwasị anyị; mbibi nke ụnwụ na mma agha na-eweta agaghị erute anyị nso.
JER 5:13 Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku, nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha. Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha.”
JER 5:14 Nʼihi ihe ndị a niile, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼihi na okwu ndị a esitela nʼọnụ ndị a pụta, aga m eme ka okwu m, nke si gị nʼọnụ na-apụta, ghọọ ọkụ. Aga m emekwa ka ndị a ghọọ nkụ ọkụ ahụ ga-erepịa.
JER 5:15 Unu bụ ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka otu mba si nʼebe dị anya bịa megide unu. Ọ bụ mba na-adị site na mgbe ochie, mba dị ike, nke unu na-adịghị anụ asụsụ ha, ndị unu na-adịghị aghọta okwu ha.
JER 5:16 Akpa àkụ ha dịka ili ghere oghe; ha niile bụkwa ndị dike nʼagha.
JER 5:17 Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere. Ha ga-ebibi ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị. Ha ga-ebibi igwe ewu na atụrụ unu, na igwe ehi unu. Ha ga-ebibikwa osisi vaịnị na osisi fiig unu. Ọ bụ mma agha ha ka ha ga-eji bibie obodo unu niile e wusiri ike, bụ obodo ndị ahụ niile unu na-atụkwasị uche.
JER 5:18 “Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Agaghị m ebibicha unu kpamkpam.
JER 5:19 Ọ ga-erukwa, mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị Chineke anyị ji mee anyị ihe dị otu a?’ Unu ga-agwa ha sị, ‘Dịka unu si gbakụta ya azụ malite ife chi ndị mba ọzọ nʼala nke aka unu, otu a ka unu ga-esi kpọọ isiala nye ndị mba ọzọ nʼala na-abụghị nke unu.’
JER 5:20 “Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya, kwusaa ya na Juda.
JER 5:21 Nụrụnụ ihe ndị a, unu ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche, unu ndị nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ, na unu ndị nwere ntị nke na-adịghị anụ ihe.
JER 5:22 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ sị, o kwesighị ka unu tụọ m egwu?” “O kwesighị ka unu maa jijiji nʼihu m? Emeela m ka uzuzu bụrụ oke osimiri nwere. Ọ bụkwa ụkpụrụ ebighị ebi nke ọ na-enweghị ike ịgafe. Ebili mmiri nwere ike magharịa, ma nke a apụghị ime ka osimiri si nʼọnọdụ ya wezuga onwe ya. Osimiri nwere ike bigbọọ, ma ọ pụghị ịgafe oke ahụ.
JER 5:23 Ma ndị a nwere obi nke na-enupu isi, na obi nke na-adịghị ekwe ekwe. Ha atụgharịala wezuga onwe ha.
JER 5:24 Ha adịghị asị onwe ha, ‘Ka anyị tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke anyị, onye na-enye anyị mmiri ozuzo nʼoge ya, ọ bụkwa ya na-eme ka anyị na-ewebata ihe ubi anyị nʼoge ya.’
JER 5:25 Ajọ omume unu emeela ka ihe ndị a hapụ irute unu aka. Mmehie unu anapụla unu ihe ọma gaara abụ nke unu.
JER 5:26 “E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m, ndị na-edo onwe ha dịka ndị mmadụ na-esiri nnụnụ ọnya, dịka ndị na-esi ọnya ka ha nwude mmadụ.
JER 5:27 Dịka nkata a kpara nke nnụnụ jupụtara nʼime ya, ụlọ ndị dị otu a jupụtara nʼaghụghọ. Nʼihi nke a, ha ghọrọ ndị ọgaranya na ndị dị ike,
JER 5:28 ha amaala abụba, anụ ahụ ha na-akwọkwa mụrụmụrụ. Ajọ ọrụ ha enweghị nsọtụ; ha adịghị achọkwa ikpe ziri ezi. Ha adịghị ekwuchite ọnụ onye na-enweghị nna; ha adịghị ekwuchitekwa ọnụ ndị ogbenye ime ka ha nweta ihe ruuru ha.
JER 5:29 M ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?” ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ. “M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?
JER 5:30 “Ihe ọjọọ nke jọbigara njọ oke emeela nʼala a.
JER 5:31 Lee, ndị amụma na-ebu naanị amụma ụgha, ndị nchụaja na-achịkwa ndị m site nʼọchịchị nke nʼaka ike, ma lee, ndị m hụrụ ndụ dị otu a nʼanya. Gịnịkwa ka unu ga-eme nʼoge ikpeazụ.”
JER 6:1 “Gbalaganụ unu ụmụ Benjamin! Sitenụ na Jerusalem gbapụ! Gbuonụ opi ike na Tekoa! Bulienụ ihe ngosi elu na Bet-Hakerem! Nʼihi na lee, ihe ọjọọ si nʼakụkụ ugwu na-abịa, e, mbibi dị ukwuu na-abịa.
JER 6:2 Aga m ebibi ada Zayọn, onye mara ezi mma, na onye dịkwa pekepeke.
JER 6:3 Ndị na-azụ atụrụ ga-eduru igwe atụrụ bịa megide ya. Ha ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ya. Onye ọbụla nʼime ha ga-elekọtazi akụkụ ala nke o ketara anya nke ọma.
JER 6:4 “Jikerenụ ibu agha megide ya! Bilienụ, ka anyị buso ha agha nʼehihie. Ma lee, anyanwụ ebidola ịda, onyinyo anyasị na-esetipụkwa onwe ya.
JER 6:5 Ya mere, bilienụ ka anyị buso ha agha, ọ bụladị nʼabalị! Ka anyị bibie ebe ha niile e wusiri ike!”
JER 6:6 Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru, “Gbutusienụ osisi niile, wuonụ nkwasa ọgụ gburugburu Jerusalem. A ghaghị ịta obodo a ahụhụ, nʼihi na mmegbu jupụtara nʼime ya.
JER 6:7 Dịka mmiri si esite nʼolulu mmiri na-asọpụta otu a ka ajọ omume na-esite nʼime ya na-asọpụta. Ihe ike na mbibi ka a na-anụ nʼime ya; ọrịa ya niile na ọnya ya niile ka a na-eche nʼihu m oge niile.
JER 6:8 Nabata ịdọ aka na ntị m, gị Jerusalem, ka m ghara ịgbakụta gị azụ, mee ka ala gị tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụkwa inwe ike ibi nʼime ya.”
JER 6:9 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Ka ha tụtụkọtasịa ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel nke ọma, dịka e si atụtụkọta mkpụrụ niile dị nʼosisi vaịnị; werenụ aka chọgharịa nʼalaka niile, dịka onye ọghọ mkpụrụ vaịnị si eme.”
JER 6:10 Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị? Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu? Ntị ha emechiela ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla. Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ; nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ.
JER 6:11 Ma ọnụma Onyenwe anyị juru m obi, apụghị m ịnagide ya nʼime m. “Wụkwasị ya nʼahụ ụmụntakịrị ndị nọ nʼokporoụzọ; wụkwasịkwa ya ụmụ okorobịa ebe ha zukọrọ. Ọ bụladị di na nwunye ga-anụrụ ụfụ ọnụma ahụ, ndị agadi na ndị ahụ merela nnọọ ezigbo agadi.
JER 6:12 A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ. A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ, mgbe m setịpụrụ aka m megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 6:13 “Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.
JER 6:14 Ha na-ekechi ọnya ndị m, dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, ‘Udo dị, udo dị,’ mgbe udo na-adịghị.
JER 6:15 O nwere ụzọ omume ha ndị a rụrụ arụ si eme ha ihere? Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị. Nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere! Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada. Ha ga-asọ ngọngọ mgbe m tara ha ahụhụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
JER 6:16 Ihe ndị a kwa bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Guzonụ nʼebe niile ụzọ gbara abụọ. Lee anya. Jụọnụ ajụjụ banyere okporoụzọ ochie ahụ. Jụpụtanụ ebe ụzọ ọma ahụ dị, jeenụ ije nʼime ya. Unu gbaso ya, unu ga-achọtara mkpụrụobi unu ebe izuike. Ma gịnị ka unu kwuru? Unu sịrị. ‘Anyị agaghị agbaso ụzọ ọma ahụ.’
JER 6:17 Ahọpụtara m ndị nche doo ha ichebe unu. Agwakwara m unu okwu sị, ‘Ṅaanụ ntị nʼụda opi ike ha.’ Ma unu kwuru sị, ‘Anyị agaghị ege ntị!’
JER 6:18 Ya mere, nụrụnụ, unu mba niile; lezienụ anya, unu ndị akaebe niile, ka unu hụrụ ihe na-aga ịbịakwasị ha.
JER 6:19 Nụrụ, gị ụwa, lee, ana m aga iwetara ndị a ịla nʼiyi, nke bụ mkpụrụ atụmatụ ọjọọ ha niile, nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m.
JER 6:20 Gịnị ka m ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke unu si nʼobodo Sheba bubata, eme? Gịnị ka m ji ụda kalamus ọma unu si mba dị anya bubata eme? Ajụla m ịnabata aja nsure ọkụ unu niile. Aja niile unu na-achụ adịghị atọ m ụtọ.”
JER 6:21 Ya mere, ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ ndị a si agafe. Nna na nwa ya ga-asọ ngọngọ nʼelu ya; otu a kwa, ndị agbataobi na enyi ha ga-ala nʼiyi.”
JER 6:22 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa; mba dị ukwuu ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa.
JER 6:23 Ha ji ụta na ùbe, ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-adịghị eme obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Zayọn.”
JER 6:24 Anyị anụla akụkọ banyere ude ha, ike agwụla aka anyị abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu na-ejide anyị dị ka nke nwanyị ime na-eme.
JER 6:25 Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi, maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ, nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị, egwu dịkwa nʼebe niile.
JER 6:26 Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe. Tụrụọnụ onwe unu na ntụ, ruonụ uju, ma kwaanụ akwa, dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara. Nʼihi na onye mbibi ahụ ga-abịakwasị anyị na mberede.
JER 6:27 “Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla, ma ọla ahụ bụkwa ndị m. Achọrọ m ka i nyochaa ma nwapụtakwa ụzọ ha niile.
JER 6:28 Ha bụ ndị nnupu isi, ndị nwere obi nʼazụ, ndị na-ejegharị na-ekwutọ ibe ha. Ha bụ bronz na igwe; ọ bụkwa ndụ rụrụ arụ ka ha na-ebi.
JER 6:29 Ngwa ọrụ ọkpụ uzu na-afụnwu ọkụ ike ike, ime ka ọkụ rechapụ akụkụ igwe ahụ na-enweghị isi, ma nnụcha ahụ na-aga nʼihu abaghị uru, nʼihi na anụchapụghị ndị ajọ omume.
JER 6:30 Ọlaọcha a jụrụ ajụ ka akpọrọ ha, nʼihi na Onyenwe anyị ajụla ha.”
JER 7:1 Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya.
JER 7:2 “Guzo nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọ Onyenwe anyị kwusaa ozi a nʼebe ahụ, “ ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị Juda niile, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a niile na-abata ife Onyenwe anyị ofufe.
JER 7:3 Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-ekwu. Mezienụ ụzọ unu na omume unu niile, m ga-ekwe ka unu biri nʼebe a.
JER 7:4 Unu atụkwasịla uche unu nʼokwu aghụghọ niile a na-agwa unu na-asị, “Nke a bụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị!”
JER 7:5 Ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu guzozie, ọ bụrụ na unu emesoo ibe unu mmeso nʼụzọ ikpe ziri ezi,
JER 7:6 ọ bụrụ na unu ahapụ imegbu ndị ọbịa, na ndị na-enweghị nna, maọbụ nwanyị di ya nwụrụ; ọ bụrụ na unu ajụ iwufu ọbara onye aka ya dị ọcha nʼebe a, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaso chi ndị ọzọ nke na-ewetara unu nsogbu,
JER 7:7 mgbe ahụ, aga m ekwere ka unu biri nʼebe a, nʼala a m nyere nna nna unu ha, ruo mgbe ebighị ebi.
JER 7:8 Ma lee, ihe unu na-eme ugbu a bụ ịtụkwasị uche unu nʼokwu aghụghọ nke na-enweghị isi.
JER 7:9 “ ‘Unu ga-aga nʼihu na-ezu ohi, na-egbu mmadụ ibe unu, na-akwa iko, ma na-eji chi ndị ọzọ na-aṅụ iyi? Unu ga-anọgide na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, ma na-agbaso chi ndị ọzọ unu na-amaghị?
JER 7:10 Unu ga-emecha bịa guzo nʼihu m nʼụlọnsọ a, nke a kpọkwasịrị aha m, na-asị, “Anyị nọ na nchekwa,” ọ bụ ịnọ na nchekwa maka ime ihe arụ niile ndị a?
JER 7:11 Ọ pụtara na ụlọ a, nke a kpọkwasịrị aha m aghọọla ogige nye ndị ohi? Ma anọkwa m ya na-ele unu anya, ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 7:12 “ ‘Otu ọ dị, biko, Jeruonụ ebe ahụ dị na Shaịlo, ebe ahụ m buru ụzọ mee ka ọ bụrụ ebe a kpọkwasịrị aha m, ka unu chọpụta ihe m mere ya nʼihi ajọ omume ndị m, ụmụ Izrel.
JER 7:13 Mgbe unu nọ na-eme ihe ndị a niile, ka Onyenwe anyị kwupụtara, agwara m unu okwu mgbe mgbe, ma unu jụrụ ige ntị. Akpọrọ m unu oku, ma unu jụrụ ịza.
JER 7:14 Nʼihi ya, ihe ahụ m mere na Shaịlo ka m ga-emekwa ọzọ megide ụlọ ahụ a kpọkwasịrị aha m. E, aga m eme ya megide ụlọnsọ ukwu ahụ unu na-atụkwasị obi unu nʼime ya, ụlọnsọ ukwu ahụ m nyere unu na nna nna unu ha.
JER 7:15 A ga-esite nʼihu m wezuga unu, tufuo unu, dịka m wezugara ma tufukwaa ụmụnna unu, bụ ndị Ifrem.’
JER 7:16 “Ya mere, unu ekperela m ekpere nʼihi ndị a; unu atụfula oge unu ịrịọ m arịrịọ nʼihi ha. Agaghị m ege ntị nʼekpere na arịrịọ unu.
JER 7:17 Ọ bụ na unu adịghị ahụ ihe na-eme nʼobodo niile nke Juda, na ihe ha na-eme nʼokporoụzọ niile nke Jerusalem?
JER 7:18 Ụmụ na-achịkọta nkụ nke nna ha ji emenye ọkụ, ebe nne ha na-eghe achịcha ha na-eche nʼihu Eze nwanyị mbara Eluigwe. Ha na-awụpụrụ chi ndị ọzọ mmanya nʼihi ịkpasu m iwe.
JER 7:19 Ọ bụ m ka ha na-akpasu iwe? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Ọ bụghị onwe ha ka ha na-emesi ike, ka ihe ihere mee ha?
JER 7:20 “ ‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Iwe m na ọnụma m ka a ga-awụkwasị nʼebe a, nʼelu ndị mmadụ, na anụmanụ, na osisi dị nʼọhịa, na mkpụrụ nke ala ubi. Ọ ga-ere ọkụ ma agaghị emenyụ ya.
JER 7:21 “ ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Gaanụ nʼihu, tụkwasịnụ aja nsure ọkụ unu nʼelu aja unu ndị ọzọ niile. Riekwanụ anụ ndị a nʼonwe unu.
JER 7:22 Nʼihi na mgbe m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha, gwa ha okwu, e nyeghị ha naanị iwu maọbụ gwa ha okwu banyere ịchụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ.
JER 7:23 Ma iwu m nyere ha bụ nke a, ruberenụ m isi, aga m abụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị nke m. Bienụ ndụ nʼiwu niile m nyere unu, ka ihe gaara unu nke ọma.
JER 7:24 Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe ndị ahụ m nyere nʼiwu. Kama ha gbasoro ọchịchọ ọjọọ nke obi rụrụ arụ ha. Kama ịga nʼihu, ha daghachiri azụ.
JER 7:25 Site na mgbe nna nna unu ha hapụrụ ala Ijipt, esepụbeghị m aka izitere unu ndị amụma bụ ndị ohu m.
JER 7:26 Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe m nyere nʼiwu. Ha bụ ndị ntị ike, ndị nọgidere na-eme ihe ọjọọ karịrị nke nna nna ha mere.’
JER 7:27 “Mgbe ị gwara ha ihe ndị a niile, ha agaghị ege ntị. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ ha oku ha agaghị aza.
JER 7:28 Ya mere, ihe ndị a ka ị ga-agwa ha, ‘Nke a bụ mba na-enwebeghị oge ha ji rubere Onyenwe anyị Chineke ha isi. O nwebekwaghị oge ọbụla ha ji nabata ịdọ aka na ntị ya. Eziokwu ọbụla adịghịkwa; okwu ọnụ ha bụ naanị ụgha ụgha.
JER 7:29 “ ‘Kpụchaanụ agịrị isi unu, tufuo ya, nọọnụ nʼebe dị elu nke tọgbọrọ nʼefu bulie abụ akwa, nʼihi na Onyenwe anyị esitela nʼoke ọnụma ya jụ ọgbọ a. Ọ gbakụtala ha azụ bụ ọgbọ nke a iwe ya na-adakwasị.
JER 7:30 “ ‘Onyenwe anyị kwupụtara sị, ndị Juda emeela ihe ọjọọ dị iche iche nʼihu m. Ha akpụọla arụsị rụrụ arụ nke ha tinyere nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ha emerụọla ya.
JER 7:31 Ha ewuolara onwe ha ebe ịchụ aja dị elu na Tofet, nke dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ebe ahụ ka ha na-anọ na-esure ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ọkụ. Ihe dị otu a abụkwaghị ụdị ihe m nyere ha nʼiwu ka ha mee. O nwekwaghị oge ihe dị otu a batara m nʼobi.
JER 7:32 Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe ndị mmadụ na-agaghị akpọkwa ebe ahụ Tofet maọbụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Kama ha ga-akpọ ya ndagwurugwu ogbugbu mmadụ, nʼihi na ha ga-eli ọtụtụ ndị ha na Tofet ruo mgbe ha na-agaghị ahụkwa ebe ha ga-eli ndị fọdụrụ.
JER 7:33 Mgbe ahụ, ozu ndị mmadụ ndị a ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha.
JER 7:34 Mgbe ahụ, aga m eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye nʼobodo niile nke Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem kwụsị. Ala ahụ ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ nʼefu.
JER 8:1 “ ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼoge ahụ a ga-esi nʼili ha wezuga ọkpụkpụ ndị eze, na ọkpụkpụ ndịisi ọchịchị Juda, na ọkpụkpụ ndị nchụaja na ndị amụma, na ọkpụkpụ ndị niile bi na Jerusalem.
JER 8:2 A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi.
JER 8:3 Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
JER 8:4 “Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ? Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ?
JER 8:5 Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha? Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ? Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike; ha jụrụ ịtụgharị.
JER 8:6 Aṅaala m ntị, ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta. O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị, “Gịnị bụ ihe a m mere?” Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya, dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha.
JER 8:7 Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe maara oge ya a kara aka. Nduru, na eleke, na okwolo makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ. Ma ndị m amaghị ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha.
JER 8:8 “ ‘Unu si aṅaa kwuo, “Ndị maara ihe ka anyị bụ, nʼihi na iwu Onyenwe anyị dị nʼaka anyị,” ebe ọ bụ na mkpisi akwụkwọ aghụghọ ndị ode akwụkwọ unu adịghị akọwa iwu ya otu o kwesiri?
JER 8:9 A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe; a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya. Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu Onyenwe anyị, ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere?
JER 8:10 Ya mere, aga m akpọnye ndị ikom ọzọ nwunye ha, werekwa ubi ha nyefee nʼaka ndị ọrụ ubi ọzọ. Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.
JER 8:11 Ha na-ekechi ọnya ndị m dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, “Udo dị, udo dị,” mgbe udo na-adịghị.
JER 8:12 Ihere o mere ha nʼihi omume arụ ha niile? Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị; nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere. Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada; ha ga-asọ ngọngọ mgbe e nyere ha ntaramahụhụ. Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
JER 8:13 “ ‘Aga m anapụ ha ihe owuwe ubi niile ha nwetara, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Ha agaghị enwekwa mkpụrụ vaịnị, maọbụ mkpụrụ osisi fiig nʼelu osisi fiig ha. Akwụkwọ osisi ndị a niile ga-akpọnwụ. A ga-anapụkwa ha ihe niile m nyere ha.’ ”
JER 8:14 Gịnị ka unu na-eme nʼebe a unu nọdụrụ ala? Kwakọtaanụ ihe unu niile. Ngwa, ka anyị gbapụnụ ọsọ gaa nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nọdụ nʼebe ahụ nwụọ! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke anyị amaala anyị ikpe ọnwụ. O nyela anyị mmiri e tinyere nsi ka anyị ṅụọ, nʼihi na anyị emehiela megide ya.
JER 8:15 Anyị lere anya udo, ma o nweghị ihe ọma ọbụla anyị hụrụ. Anyị lere anya ọgwụgwọ ọrịa anyị, maọbụ naanị ihe egwu ka anyị hụrụ.
JER 8:16 E sitere na Dan nụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro. Ala a niile mara jijiji mgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike. Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha na-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya.
JER 8:17 “Lee, ana m ezibata agwọ ọjọọ, ndị na-atagbu atagbu, nʼetiti unu. Ajụala nke ọ dịkwaghị ụra ga-arata ha. Ana m ezibata ha ka ha taa unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 8:18 Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m, nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m.
JER 8:19 Gee ntị nụrụ akwa ndị m ka ọ na-ada site nʼebe dị anya. “Onyenwe anyị, ọ sitela na Zayọn pụọ? Ọ pụtara na Eze ha anọkwaghị nʼebe ahụ?” “Gịnị mere ha ji site nʼoyiyi a tụrụ atụ, na arụsị ndị mba ọzọ ha na-efe kpasuo m iwe?”
JER 8:20 “Oge owuwe ihe ubi agafeela, leekwa na ọkọchị agabigakwala, ma a zọpụtabeghị anyị.”
JER 8:21 Ebe ọ bụ na a zọpịara ndị m, ọ bụkwa m ka azọpịara. Anam eru ụjụ, oke egwu jisikwara m aka ike.
JER 8:22 Ọ pụtara na o nweghị mmanụ otite na-eme ka ọnya laa dị na Gilead? Ọ bụ na e nwekwaghị dibịa nọ nʼebe ahụ? Gịnị mere o nweghị ọgwụgwọ dịrị ndị m nʼihi mmerụ ahụ ha niile?
JER 9:1 Ọ gaara adị m mma ma a sị na isi m bụ isi iyi, ebe mmiri si asọpụta; ọ gaara adị m mma ma a sịkwa na anya mmiri akwa jupụtara m nʼanya. Agaara m akwagide akwa ehihie na abalị nʼihi ndị m niile e gburu egbu.
JER 9:2 Ọ gaara adị m mma ma a sị na m nwere ụlọ ndị ije e wuru nʼime ọzara. Ka m nwee ike hapụ ndị m site nʼebe ha nọ pụọ. Nʼihi na ha niile bụ ndị na-akwa iko, igwe ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.
JER 9:3 “Ha na-ekwe ire ha dịka ụta, ịgbapụ okwu ụgha dịka àkụ; Ọ bụghị site nʼeziokwu ka ihe ji agara ha nke ọma nʼala ahụ. Ha na-esite nʼotu mmehie gaa nʼọzọ; ọ dịkwaghị mgbe ha ji mara m,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 9:4 “Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ. Atụkwasịkwala nwanne gị obi. Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ. Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ.
JER 9:5 Enyi na-aghọgbu enyi ya, ọ dịkwaghị onye na-agwa ibe ya eziokwu. Ha azụọla ire ha ikwu naanị okwu ụgha; ha emeekwala ka ike gwụ anụ ahụ ha ime mmehie.
JER 9:6 I bi nʼetiti aghụghọ. Ha jụkwara ịmara m nʼime aghụghọ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 9:7 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa. Gịnị ọzọ ka m kwesiri ime nʼihi mmehie ndị m?
JER 9:8 Ire ha na-egbu dịka àkụ. Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta. Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo, ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.”
JER 9:9 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị, “M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?”
JER 9:10 Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa. Nʼebe ahụ ka m ga-anọ kwaa ụwa m nʼihi ebe ịta nri nke anụmanụ ndị ahụ dị nʼọzara. Ha tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịghị onye na-ejegharị nʼime ya. A naghị anụkwa olu anụ ụlọ nʼebe ahụ. Ụmụ nnụnụ efefusịala. Otu a kwa, ụmụ anụmanụ alaala.
JER 9:11 “Aga m eme ka Jerusalem ghọọ ebe a na-awụfu unyi. Ọ ga-aghọ ebe nkịta ọhịa na-awagharị na-achọ nri. Aga m ekposa obodo niile nke Juda. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi na ya.”
JER 9:12 Olee onye ahụ maara ihe, nke nwere ike ịghọta ihe ndị a niile? Onye ka Onyenwe anyị ziri ihe ndị a, nke ga-akọwa ya? Gịnị mere e ji bibie ala a, kposaa ya, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka ọzara mmadụ na-enweghị ike ịgafe?
JER 9:13 Onyenwe anyị kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ha agbakụtala iwu ahụ m nyere ha idebe azụ. Ha jụrụ irubere m isi, jụkwa ịgbaso iwu m.
JER 9:14 Kama, ha na-agbaso isiike nke obi ha, ha gbasoro chi Baal dịka nna nna ha si kuziere ha.”
JER 9:15 Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel kwuru, “Lee, aga m eme ka ndị a rie nri na-akụ ilu. Ha ga-aṅụkwa mmiri e tinyere nsi.
JER 9:16 Aga m ekposa ha na mba niile nke ụwa. Ha ga-ebi na mba nke ha na nna ha na-amaghị. Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m bibiri ha niile.”
JER 9:17 Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Tụgharịanụ uche unu ugbu a. Kpọọnụ ụmụ nwanyị ndị ọrụ ha bụ ịbụ abụ akwa. E, zienụ ozi ka ndị ọkachamara nʼetiti ha bịa.
JER 9:18 Ha bịa ngwangwa kwaa akwa nʼihi anyị, tutu anya mmiri akwa ejupụta ha nʼanya, tutu anya mmiri akwa esite anyị nʼanya na-asọda ruo na ntị anyị.
JER 9:19 Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn ‘Lee ka anyị si laa nʼiyi! Lee ka ihe ihere anyị si dị ukwuu! Nʼihi na anyị hapụrụ ala anyị, nʼihi na ha etikpọsịala ebe obibi anyị niile.’ ”
JER 9:20 Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị, megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ. Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa, kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa.
JER 9:21 Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị bata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị. O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ, gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama.
JER 9:22 Gwa ha, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “ ‘Ozu ndị nwụrụ anwụ ga-atọgbọrọ dịka unyi e kpofuru nʼọhịa, dịka ukwu ọka nke e gbuturu nʼazụ onye na-aghọ mkpụrụ ubi, nke ọ dịghị onye ga-achịkọta ha.’ ”
JER 9:23 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ka onye maara ihe hapụ ịnya isi nʼihi amamihe ya, ka onye dị ike ghara ịnya isi nʼihi ịdị ike ya, ka ọgaranya hapụkwa ịnya isi nʼihi ịba ụba nke akụ ya,
JER 9:24 kama, onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa isi nʼihi nke a: na o nwere uche ịghọta na mụ onwe m bụ, Onyenwe anyị nke na-eme obi ebere, na-ekpe ikpe ziri ezi na ezi omume nʼụwa. Nʼihi nʼihe ndị a ka m na-enwe obi ụtọ,” ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 9:25 “Lee, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata ndị ahụ niile nke e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ha ahụhụ.
JER 9:26 Ya bụ ndị Ijipt, Juda, Edọm, Amọn, na Moab, na ndị ahụ niile bi nʼọzara nʼebe dị anya. Nʼihi na, nʼezie, mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu. Ọ bụladị ụlọ Izrel niile bụ ndị a na-ebighị ugwu nʼime obi ha.”
JER 10:1 Nụrụnụ ihe Onyenwe anyị na-agwa unu, ụmụ Izrel.
JER 10:2 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Unu amụtala ụzọ ndị mba ọzọ, unu atụkwala ụjọ ihe ịrịbama niile nke na-apụta ihe na mbara eluigwe, ọ bụ ezie na ndị mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ.
JER 10:3 Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru. Ha na-aba nʼọhịa gbute osisi, nke onye ǹka osisi na-eji anyụike pịara ha ihe.
JER 10:4 Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma, jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike, ka ọ ghara ịda.
JER 10:5 Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ, ha adịghị ekwu okwu. A na-ebugharị ha nʼaka nʼihi na ha adịghị eje ije. Unu atụla ha egwu, nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ, ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.”
JER 10:6 O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị. Ị dị ukwuu. Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike.
JER 10:7 Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu? Ọ bụ gị bụ eze mba niile. Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile, na nʼalaeze niile, ọ dịghị onye dịka gị.
JER 10:8 Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu. Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe.
JER 10:9 A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma, site na Ụfaz bubata ọlaedo. Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo. Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile.
JER 10:10 Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie. Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi. Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji. Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ.
JER 10:11 “Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ”
JER 10:12 Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa. Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya, ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
JER 10:13 Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa. Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie. Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo, na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe.
JER 10:14 Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ. Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ. Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ; ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.
JER 10:15 Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo, mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.
JER 10:16 Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a, nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile, tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
JER 10:17 Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a, nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu.
JER 10:18 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼoge a, aga m amafu ndị niile bi nʼala a. M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha, meekwa ka ndị iro ha jide ha.”
JER 10:19 Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ. Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ. Ma ana m akasị onwe m obi na-asị, “Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.”
JER 10:20 Ebibiela ụlọ ikwu m, e tibisiala ụdọ ya niile. Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya. Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m, maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike.
JER 10:21 Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche. Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị, ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma, igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.
JER 10:22 Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa, oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu, ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu, ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa.
JER 10:23 O Onyenwe anyị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya, na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso.
JER 10:24 Ya mere, Onyenwe anyị, site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị, ma ọ bụghị site nʼiwe gị, ma ọ bụghị ya, ị ga-eme ka m ghọọ ihe efu.
JER 10:25 Wụkwasị ọnụma gị nʼelu mba niile dị iche iche bụ ndị na-amaghị gị, wụkwasịkwa ya ndị ahụ niile na-adịghị akpọku aha gị. Nʼihi na ha eripịala Jekọb, ha eripịala ya kpamkpam, bibiekwa ebe obibi ya.
JER 11:1 Nke a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya,
JER 11:2 “Gee ntị nʼihe niile metụtara ọgbụgba ndụ a, gwakwa ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem.
JER 11:3 Gwa ha na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-adịghị edebe ihe niile banyere ọgbụgba ndụ a,
JER 11:4 bụ nke m nyere nna nna unu ha, mgbe m si nʼIjipt, site nʼoke ọkụ e ji agbaze igwe, kpọpụta ha.’ Asịrị m, Ruberenụ m isi, meekwa ihe niile m nyere unu nʼiwu, unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụkwa Chineke unu.
JER 11:5 ‘Mgbe ahụ, aga m emezu iyi ahụ m ṅụụrụ nna nna unu ha, inye ha ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,’ ya bụ, ala ahụ unu bi nʼime ya taa.” Azara m sị, “Amen, Onyenwe anyị.”
JER 11:6 Onyenwe anyị sịrị m, “Kpọsaa okwu ndị a nʼobodo Juda niile, na nʼokporoụzọ Jerusalem niile, ‘Geenụ ntị nʼiwu nke ọgbụgba ndụ ahụ, ma mezuo ihe o kwuru.
JER 11:7 Site nʼoge ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha ruo taa, adọọla m unu aka na ntị mgbe mgbe sị, “Ruberenụ m isi.”
JER 11:8 Ma ha jụrụ ige ntị. Ha akpọkwaghị okwu m mkpa dịrị ha. Kama ha jegharịrị nʼisiike nke obi ọjọọ ha. Ọ bụ nke a mere m ji mee ka ọbụbụ ọnụ niile nke ya na ọgbụgba ndụ ahụ so bịakwasị ha, dịka m buru ụzọ nye nʼiwu, ma ihe ndị a emeghị ka ha jezie ije.’ ”
JER 11:9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Achọpụtala na-enwere njikọta na ịgba izu mmegide nʼetiti ndị Juda na ndị bi na Jerusalem.
JER 11:10 Ha alaghachila azụ nʼụdị mmehie ahụ nna nna ha mehiere, bụ ndị ahụ jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha agbasoola chi ndị ọzọ na-efe ha. Ụlọ Izrel na ụlọ Juda adịghị edebekwa ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara.
JER 11:11 Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka mbibi, nke ha na-enweghị ike ịgbanarị, bịakwasị ha. Ọ bụrụkwa na ha akpọkuo m agaghị m aṅa ntị.
JER 11:12 Ndị obodo Juda na ndị bi na Jerusalem ga-apụ kpọkuo chi ndị ahụ niile ha na-achụrụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ma chi ndị a agaghị enyere ha aka mgbe mbibi a bịakwasịrị ha.
JER 11:13 Gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dị iche iche dịka obodo dị nʼime gị si dị ọtụtụ. Ebe ịchụ aja i wukwara nʼihi ịchụrụ chi ahụ na-eweta ihere bụ Baal aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, dịkwa ọtụtụ dịka okporoụzọ dị na Jerusalem.’
JER 11:14 “Ekperela ndị a ekpere, arịọkwala arịrịọ ọbụla nʼihi ha. Nʼihi na agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọku m nʼoge ihe mgbu ha.
JER 11:15 “Gịnị ka onye m hụrụ nʼanya na-eme nʼime ụlọnsọ ukwuu m, mgbe ya na ọtụtụ ndị ọzọ na-ejikọta onwe ha nʼotu ịtụ atụmatụ ihe ọjọọ? Anụ e doro nsọ apụghị ime ka ahụhụ unu kwesiri ịnata hapụ ịbịakwasị unu. A sị na o si otu a dịrị, mgbe ahụ, unu pụrụ ịṅụrị ọṅụ mgbe unu na-eme ihe ọjọọ unu.”
JER 11:16 Aha Onyenwe anyị nyere gị bụ Osisi oliv dị ndụ, nke na-amị mkpụrụ mara mma. Ma ọ bụ olu mkpọtụ nke oke mmiri ozuzo ka ọ ga-eji mụkwasị gị ọkụ; alaka gị ga-agbajisikwa.
JER 11:17 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye ahụ kụnyere gị nʼala, e nyela iwu na mbibi ga-abịakwasị gị, nʼihi na ndị Izrel na Juda emeela ihe ọjọọ, kpasuo m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal.
JER 11:18 Ọ bụ Onyenwe anyị kpughere izuzu ọjọọ ha nye m; amatakwara m ihe ha na-ezube, nʼihi na o gosiri m ya nʼoge ahụ.
JER 11:19 Mụ onwe m dị ka nwa atụrụ dị nwayọọ nke e du na-aga ebe a ga-egbu ya. Ma aghọtaghị m na ọ bụ m ka ha zubererị nzube ọjọọ megide. Ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị bibie osisi a na mkpụrụ ya. Ka anyị site nʼala ndị dị ndụ wezuga ya, ka a hapụ ichetakwa aha ya ọzọ”
JER 11:20 Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, na-anwapụtakwa obi mmadụ na mmụọ ya. Mee ka m hụ mgbe ị ga-abọ ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m na-etinye okwu a metụtara m.
JER 11:21 Ya mere, nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị Anatot ahụ na-achọ ịnapụ gị ndụ gị, ndị ahụ na-asị gị, “Ebukwala amụma site nʼaha Onyenwe anyị ka ị ghara ịnwụ nʼaka anyị.”
JER 11:22 Nʼihi nke a Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, sị, “Aga m ata ha ahụhụ. Ụmụ okorobịa ha ga-anwụ site na mma agha, ụnwụ ga-egbukwa ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom.
JER 11:23 O nweghị ndị ga-afọdụ ndụ nʼime ha nʼihi na a ga-eme ka oke mbibi bịakwasị ndị Anatot nʼafọ ahụ m ga-ata ha ahụhụ.”
JER 12:1 Onye ezi omume ka ị bụ mgbe niile, gị Onyenwe anyị, mgbe ọbụla m butere ikpe bịa nʼihu gị. Ma achọrọ m ịgwa gị okwu banyere ikpe ziri ezi gị: Gịnị mere ihe ji agara ndị ajọ omume nke ọma? Gịnị mere ndị na-aghọ aghụghọ ji ebi ndụ enweghị nsogbu ọbụla?
JER 12:2 Ị kụọla ha ka osisi, ha agbaala mgbọrọgwụ; ha na-etokwa na-amị mkpụrụ. Ị nọ nso mgbe niile nʼọnụ ha, ma ị nọ nʼebe dị anya nʼobi ha.
JER 12:3 Ma gị onwe gị maara m Onyenwe anyị; ị na-ahụ m, na-anwapụtakwa echiche niile m na-eche banyere gị. Dọkpụrụ ha dịka atụrụ a ga-egbu egbu. Doo ha iche nye ụbọchị ahụ a ga-egbu ha.
JER 12:4 Ruo ole mgbe ka ala ga-eru ụjụ? Ruo ole mgbe ka ahịhịa dị nʼubi ga-anọgide na-akpọnwụ? Ụmụ anụmanụ na nnụnụ na-anwụchasị nʼihi na ndị bi nʼala ahụ bụ ndị na-emebi iwu. Ma ndị mmadụ ahụ na-ekwu sị, “Ọ gaghị ahụ ihe ga-adakwasị anyị.”
JER 12:5 “Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara, i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi? Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị, ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan?
JER 12:6 Lee, ọ bụladị ụmụnne gị, ndị ezinaụlọ nke aka gị, ararala gị nye. Lee, ha eweliela oke olu iti mkpu megide gị. Atụkwasịla ha obi, ọ bụladị mgbe ha na-ekwu okwu ọma banyere gị.
JER 12:7 “Aga m agbakụta ụlọ m na ihe nketa m họpụtara nye onwe m azụ. Aga m ewere onye ahụ m hụrụ nʼanya nyefee ya nʼaka onye iro ya.
JER 12:8 Ihe nketa m aghọrọọla m, ihe dịka ọdụm nọ nʼọhịa, Ọ na-agbọ ụja megide m; ya mere, m ji kpọọ ya asị.
JER 12:9 Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya? Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile, mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri.
JER 12:10 Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m. Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ, ha emeela ka ubi m mara mma ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu.
JER 12:11 Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu; e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m. Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi.
JER 12:12 Ndị mbibi ga-ejupụta nʼelu ebe niile dị elu nke ọzara, nʼihi na mma agha Onyenwe anyị ga-esite nʼotu nsọtụ ala ahụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, ripịa ndị niile dị na ya. O nweghị onye ọbụla udo ga-adịrị nʼala ahụ.
JER 12:13 Ha ga-agha mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ ogwu ga-epuru ha. Ha ga-adọgbu onwe ha nʼọrụ ma ha agaghị enweta ihe ọbụla. Ya mere, ka ihe ihere unu ghọtara dịka ihe ubi dịrị unu, nʼihi na ahụhụ ndị a sitere nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.”
JER 12:14 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ma banyere ndị agbataobi ọjọọ m ahụ niile, bụ ndị na-apụnara ndị m Izrel ihe nketa ahụ m nyere ha. Aga m esite nʼala ha hopu ha. Aga m esitekwa nʼetiti ha hopu ụlọ Juda.
JER 12:15 Ma mgbe m hopuchara ha, aga m emesịa meere ha ebere, meekwa ka onye ọbụla nʼime ha laghachikwa nʼobodo nke aka ya. Ha ga-enwetakwa ihe nketa ha niile.
JER 12:16 Ọ bụrụkwa na ha amụta ụzọ niile nke ndị m nke ọma, na iji aha m ṅụọ iyi, na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ dịka ha si kuziere ndị m iji aha Baal na-aṅụ iyi, aga m eme ka ha guzosie ike nʼetiti ndị m.
JER 12:17 Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ajụ ige ntị, aga m ehopu ha kpamkpam, laa ha nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 13:1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, zụta mgbado ukwu akwa ọcha nke a na-eke nʼukwu. Ị zụtachaa ya, kekwasị ya nʼukwu gị. Ma ekwekwala ka o metụ na mmiri.”
JER 13:2 Ejere m zụta ajị ahụ dịka Onyenwe anyị kwuru, kee ya nʼukwu m.
JER 13:3 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ, sị m,
JER 13:4 “Were ajị ahụ ị zụtara, nke i kekwasịrị nʼukwu gị, bilie, jee nʼosimiri Yufretis. I ruo, zoo ihe okike ukwu ahụ na mgbawa nkume dị nʼebe ahụ.”
JER 13:5 Ya mere, apụrụ m, jee, zoo ya na Yufretis dịka Onyenwe anyị gwara m.
JER 13:6 Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Bilie, jeghachi Yufretis. I jeruo, wepụta ajị ahụ m sị gị zoo nʼebe ahụ.”
JER 13:7 Ya mere, agara m Yufretis, gwupụta ajị ahụ site nʼebe m zoro ya, ma mgbe m wepụtara ya, ahụrụ m na o mebiela, na ọ bakwaghị uru ọbụla.
JER 13:8 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
JER 13:9 “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Nʼotu aka ahụ, mụ onwe m ga-ebibi mpako Juda na oke mpako Jerusalem.
JER 13:10 Ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m, ndị ahụ na-ejegharị nʼisiike nke obi ha na-agbaso chi ndị ọzọ na-efe ma na-akpọkwa isiala nye ha. Ha ga-adịka belịt a, nke na-abakwaghị uru ọbụla.
JER 13:11 Nʼihi na dịka belịt mmadụ kere nʼukwu ya si arapara ya nʼukwu, otu a ka m si mee ka ụlọ Izrel niile, na ụlọ Juda niile rapara m nʼahụ,’ ime ka ha ghọọ ndị m, ndị a ga-esite na ha bulie aha m elu, nye m otuto na nsọpụrụ. Ma ha ajụla ige ntị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 13:12 Sị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: A ga-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya. Ọ bụrụ na ha sị gị, ‘Ọ bụ na anyị amaghị na a na-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya?’
JER 13:13 Mgbe ahụ gwa ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ndị bi nʼala a ṅụbiga mmanya oke, ma onye eze na-anọkwasị nʼocheeze Devid, ma ndị nchụaja, na ndị amụma niile bi na Jerusalem.
JER 13:14 Aga m atụpịakwa ha, otu onye nʼelu ibe ya, nna na ụmụ ya nʼelu ibe ha kwa. Agaghị m ekwe ka obi ọmịiko, maọbụ obi ebere gbochie m ibibi ha.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 13:15 Nụrụnụ, geekwanụ ntị, unu ebulila onwe unu elu, nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya.
JER 13:16 Nyenụ Onyenwe anyị Chineke unu nsọpụrụ. Tupu o mee ka ọchịchịrị dakwasị unu; tupu unu akpọbie ụkwụ unu nʼelu ugwu gbara ọchịchịrị. Unu na-ele anya ìhè ma ọ ga-eme ka ihe ahụ ghọọrọ unu oke ọchịchịrị. Ọ ga-agbanwe ihe ahụ, mee ka ọ ghọọ onyinyo ọnwụ.
JER 13:17 Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị. Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa nʼihi mpako unu. Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta; anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu nʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha.
JER 13:18 Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha, “Sitenụ nʼocheeze unu rịdata, nʼihi na okpueze ọma unu ga-esi nʼisi unu dapụ.”
JER 13:19 A ga-emechi obodo niile nke Negeb. Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha. A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ.
JER 13:20 Welienụ anya unu ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa. Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ, igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi?
JER 13:21 Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?
JER 13:22 Mgbe ahụ, ị ga-ajụkwa obi gị ajụjụ sị, “Gịnị mere ihe ndị a ji dakwasị m?” Ọ bụ nʼihi ịba ụba nke mmehie gị ka e ji dọwaa uwe mwụda gị, merụọ gị ahụ nʼakụkụ ahụ gị niile.
JER 13:23 Onye Kush ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya? Agụ ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya tụrụ agwa agwa? Nʼụzọ dị otu a kwa, unu ndị ihe ọjọọ riri ahụ apụghị ime ezi ihe.
JER 13:24 “Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ, nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị.
JER 13:25 Nke a bụ ihe unu fetara na nza, oke nke m kwadoro si nʼaka m inye unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Nʼihi na unu echefuola m, tụkwasị obi unu na chi okwu ụgha dị iche iche.
JER 13:26 Ya mere, aga m ekpughepụ uwe i yi nʼahụ, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gbaa gị ọtọ. Ihere ga-emekwa gị.
JER 13:27 Mgbe ahụ, ịkwa iko gị niile ga-apụta ihe ya na agụụ ihe ọjọọ niile na-agụ gị, na ọnọdụ enweghị ihere nke ịgba akwụna gị niile! Nʼihi na ahụla m omume rụrụ arụ gị niile, nke ị na-eme nʼelu ugwu, na nʼime ọhịa. Ahụhụ dịrị gị, Jerusalem! Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide nʼime adịghị ọcha gị?”
JER 14:1 Nke a bụ okwu Onyenwe anyị, nke rutere Jeremaya banyere ụkọ mmiri.
JER 14:2 “Juda na-eru ụjụ, ndị bi nʼobodo ya niile na-ahụjukwa anya. Ha na-akwa akwa nʼihi ala ahụ, ụda ịkwa akwa ha eruokwala Jerusalem.
JER 14:3 Ndị a na-asọpụrụ na-ezipụ ndị ohu ha ịga chọta mmiri. Ha na-aga nʼolulu mmiri ma o nweghị mmiri ha na-achọta. Ha bu ite nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya na-alọta. Ha ji aka ha kpuchie isi ha nʼihi ịda mba nke obi na nʼihi ọnọdụ obi ọjọọ nke ha nọ nʼime ya.
JER 14:4 Ala na-agbawa nʼihi enweghị mmiri ozuzo. Ndị ọrụ ubi na-ekpuchikwa isi ha nʼihi obi ọjọọ ha.
JER 14:5 Ọ bụladị nne ele, nke nọ nʼọhịa, na-ahapụ nwa ọhụrụ ya, nʼihi na ahịhịa ndụ adịghị.
JER 14:6 Ịnyịnya ibu ọhịa na-eguzokwa nʼelu ebe dị elu nke ahịhịa na-adịghị. Ha na-eku ume na-ekupụ ngwangwa, ngwangwa, dịka nkịta ọhịa; anya ha adabamiela ha nʼisi nʼihi ahụghị ahịhịa ndụ ha ga-ata.”
JER 14:7 Ọ bụ ezie na mmehie anyị na-agbagide anyị ama, Onyenwe anyị, biko rụọ ọrụ gị nʼihi aha gị. Anyị emehiela megide gị. Ndaghachi azụ anyị site nʼebe ị nọ dịkwa ukwuu.
JER 14:8 Gị, onye bụ olileanya Izrel. Onye Nzọpụta ya nʼoge ahụhụ, gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ọbịa nʼala a, dịka onye ije nke na-anọ naanị ọnọdụ otu abalị?
JER 14:9 Gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ihe mere na mberede, dịka dike nke na-enweghị ike ịzọpụta? Onyenwe anyị, ị nọ nʼetiti anyị; ọ bụkwa aha gị ka a kpọkwasịrị anyị. Ahapụkwala anyị!
JER 14:10 Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere ndị a, “Ha hụrụ mwagharị nʼanya nke ukwuu. Ụkwụ ha adịghị anọkwa nʼotu ebe. Nʼihi nke a, ihe banyere ha adịghị atọkwa Onyenwe anyị ụtọ. Ugbu a kwa ka ọ na-echeta ajọ omume ha, ọ ga-atakwa ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”
JER 14:11 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ekpela ekpere nʼihi ọdịmma ndị a.
JER 14:12 Ọ bụ ezie na ha na-ebu ọnụ, agaghị m ege ntị nʼakwa ha; ọ bụrụkwa na ha achụọrọ m aja nsure ọkụ, maọbụ aja mkpụrụ onyinye, agaghị m anabata ha. Kama, aga m eji mma agha na ụnwụ, na ọrịa dị iche iche bibie ha.”
JER 14:13 Ma asịrị m, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Lee na ndị amụma na-asị ha, ‘Unu agaghị ahụ mma agha anya, maọbụ hụ ahụhụ nke ụnwụ na-eweta, nʼeziokwu, aga m enye unu udo nke na-adịgide adịgide nʼebe a.’ ”
JER 14:14 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m okwu sị, “Ndị amụma ahụ na-ebu amụma ụgha nʼaha m. Ọ bụghị m họpụtara ha, ọ bụghị m gwara ha okwu, ọ bụkwaghị m ziri ha. Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu, amụma ụgha nke ọhụ ụgha, na nke ịgba afa, na nke na-enweghị isi, na nke si nʼobi ha nke aghụghọ jupụtara.
JER 14:15 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ndị amụma ahụ na-ebu amụma nʼaha m. Ọ bụghị m ziteere ha, ma ha nọgidere na-asị, ‘Mma agha na ụnwụ enweghị ike ịbịaru ala a nso.’ Ndị amụma a niile ka a ga-ebibi site na mma agha na ụnwụ.
JER 14:16 A ga-esitekwa nʼụlọ tụpụ ndị ahụ niile ha na-eburu amụma nʼokporoụzọ Jerusalem nʼihi ụnwụ na mma agha. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ndị nwunye ha, maọbụ ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Nʼihi na aga m awụkwasị ha ihe ọjọọ ahụ niile ruuru ha.
JER 14:17 “Gwa ha okwu ndị a, “ ‘Ka anya mmiri si nʼanya m na-eruda ehihie na abalị, na-akwụsịghị akwụsị, nʼihi ndị m, nʼihi ada ndị m, nke na-amaghị nwoke, ndị hụrụla ahụhụ dị ukwuu, ndị e tipụtara ọnya jọrọ njọ.
JER 14:18 Ọ bụrụ na m apụọ jee nʼime ime obodo ana m ahụ ndị e ji mma agha gbuo; Ọ bụrụ na m abata nʼobodo ukwu, ana m ahụ mbibi nke ụnwụ wetara. Ma onye amụma ma onye nchụaja agaala nʼala nke ha amaghị.’ ”
JER 14:19 Ị jụla Juda kpamkpam? Ọ pụtara na ihe banyere Zayọn adịghị atọkwa gị ụtọ? Gịnị mere i ji tigbuo anyị ruo na ọgwụgwọ adịghịkwa nye anyị? Anyị lere anya udo, ma ọ dịghị ezi ihe bịara; anyị lere anya ọgwụgwọ, ma lee, ihe anyị hụrụ bụ oke egwu.
JER 14:20 Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị, na ikpe mara nna nna anyị ha; nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị.
JER 14:21 Elelịla anyị anya, nʼihi aha gị. Ekwela ka ocheeze gị dị ebube bụrụ ihe a na-adịghị asọpụrụ. Cheta ọgbụgba ndụ nke anyị na gị gbara; emebikwala ya.
JER 14:22 Ọ dị chi ihe efu nke ndị mba ọzọ nwere ike ime ka mmiri zoo? Mbara eluigwe ọ pụrụ ime ka mmiri zoo site nʼike aka ya naanị? Mba! Ọ bụ gị, Onyenwe anyị Chineke anyị pụrụ ime ihe ndị a. Nʼihi nke a, olileanya anyị dị nʼime gị, nʼihi na ọ bụ gị na-eme ihe ndị a niile.
JER 15:1 Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ọ bụrụ na Mosis na Samuel apụta bịa guzo nʼihu m, ụdịdị obi m agaghị agbanwe nʼebe ndị a nọ. Chụpụ ha nʼihu m. Mee ka ha si nʼebe a pụọ.
JER 15:2 Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ, ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu; ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu, otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’
JER 15:3 “Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 15:4 Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem.
JER 15:5 “Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem? Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị? Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị?
JER 15:6 Gị onwe gị ajụla m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ị nọgidela na-adaghachi azụ. Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị. Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.
JER 15:7 Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha nʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ. Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
JER 15:8 Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba. Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri. Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibi bịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha; na mberede ka m ga-eme ka nhụju anya na ihe oke egwu bịakwasị ha.
JER 15:9 Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba, kubie ume. Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị, ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala. Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ site na mma agha ndị iro ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 15:10 Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m, onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu. O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego, ma mmadụ niile na-akọcha m.
JER 15:11 Onyenwe anyị kwuru sị, “Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe, aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu.
JER 15:12 “Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe, ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz?
JER 15:13 “Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị, nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla. Nʼihi na mmehie gị niile ejupụtala nʼala a niile.
JER 15:14 Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị. Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị. Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụ nke ga-eregbu gị.”
JER 15:15 Ị maara O Onyenwe anyị, ya mere cheta m, lekọtaakwa m. Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m. Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi. Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị.
JER 15:16 Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri. Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ, nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
JER 15:17 O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ. Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ. A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m. I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha.
JER 15:18 Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị? Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya? Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ, dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi.
JER 15:19 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na i chegharịa, aga m etinyeghachi gị nʼọnọdụ gị, ime ka i guzokwa nʼihu m. Ọ bụrụ na okwu si gị nʼọnụ abụrụ okwu kwesiri ntụkwasị obi, okwu na-abụghị okwu nzuzu ị ga-abụ onye na-ekwuchitere m ọnụ m. Ndị a ga-alaghachikwute gị ma i gaghị alaghachikwuru ha.
JER 15:20 Aga m eme ka ị dịrị ka mgbidi nʼebe ha nọ. Ị ga-abụ mgbidi e wusiri ike, nke e ji bronz wuo. Ha ga-ebuso gị agha, ma ha agaghị emeri gị nʼihi na m nọnyeere gị ịnapụta gị, nakwa ịzọpụta gị,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 15:21 “Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ. Gbapụtakwa gị site nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.”
JER 16:1 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
JER 16:2 “Ị gaghị alụtara onwe gị nwunye, ị gaghị amụtakwa ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼebe a.”
JER 16:3 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụmụ ndị ikom niile na ụmụ ndị inyom niile a mụrụ nʼala a. Otu a ka ọ kwukwara banyere nne na nna ụmụntakịrị ndị a.
JER 16:4 “Ha ga-anwụ site nʼajọ ọrịa nke ga-egbu ha niile. O nweghị onye ga-eru ụjụ nʼihi ha, a gaghị elikwa ha. Kama ha ga-adị ka unyi e kposara nʼala. Mma agha na ụnwụ ga-ala ha nʼiyi, ozu ha ga-abụkwa ihe oriri nye ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa nke ụwa.”
JER 16:5 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Abanyela nʼụlọ ọbụla a na-akwa ozu; abanyela maka iso ha ruo ụjụ, maọbụ maka igosi ha ebere, nʼihi na ewepụla m ngọzị m nʼịhụnanya m, na ọmịiko m site nʼebe ha nọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 16:6 “Ma ndị ukwu na ndị nta nʼime ha ga-anwụ nʼala a. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ruo ụjụ nʼihi ha. O nweghị onye ga-akpụcha isi ya, maọbụ gbuo onwe ya mma nʼihi ha.
JER 16:7 O nweghị onye ga-eweta ihe oriri nye ndị zukọrọ maka ịkasị ndị na-eru ụjụ obi. Nri agaghị adị ọ bụladị nye ndị na-eru ụjụ, nʼihi ọnwụ nna ha maọbụ ọnwụ nne ha. Ọ dịkwaghị onye ga-enye ha ihe ọṅụṅụ nʼihi ịkasị ha obi.
JER 16:8 “Abanyekwala nʼụlọ ebe e nwere oriri soro ndị nọ nʼebe ahụ nọdụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ
JER 16:9 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụkwa Chineke Izrel kwuru, ‘Nʼihu gị, na nʼoge ndị a niile ị dị ndụ, ka m ga-eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na nke ndị inyom na-alụ di na nwunye kwụsị.’
JER 16:10 “Mgbe ị gwara ndị a ihe ndị a, ha ga-ajụ gị ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji kpebie izitere anyị ụdị oke ịla nʼiyi dị otu a? Gịnị bụ ihe ọjọọ anyị mere? Gịnị bụ mmehie anyị mere megide Onyenwe anyị Chineke anyị?’
JER 16:11 Mgbe ahụ, ị ga-asa ha sị ha, ‘Ihe ndị a na-adakwasị unu nʼihi na nna nna unu ha gbakụtara m azụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘gbasoro, fee ma kpọọkwa isiala nye chi ndị ọzọ. Ha jụrụ iso m, jụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu.
JER 16:12 Ma unu emesoola m mmeso ọjọọ karịa ụdị mmeso nna unu ha mesoro m. Lee ka unu niile nʼotu nʼotu si agbaso ụzọ isiike nke obi ọjọọ unu chepụtara, kama irubere m isi.
JER 16:13 Ya mere, aga m esite nʼala a tufuo unu. Aga m atụbanye unu nʼala ahụ unu na nna unu ha na-amaghị. Ebe ahụ ka unu ga-anọkwa fee chi ndị ọzọ ehihie na abalị. Nʼihi na agaghị m emere unu amara.’
JER 16:14 “Otu ọ dị, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na adị ndụ, bụ onye ahụ sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.’
JER 16:15 Ma a ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọpụtara Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba ahụ niile ọ chụsara ha.’ Nʼihi na aga m akpọlata ha nʼala ahụ m nyere nna nna ha.
JER 16:16 “Ma ugbu a, aga m ezipu ọtụtụ ndị ọkụ azụ ka ha gaa jide ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mgbe nke ahụ gasịrị, aga m ezipụkwa ọtụtụ ndị na-achụ nta, ndị ga-esite nʼelu ugwu ukwu niile na nʼelu ugwu nta niile, na nʼọnụ mgbawara dị na nkume niile, chụọ nta ha.
JER 16:17 Ana m ahụzu ụzọ ha niile. O nweghị ihe zoro ezo nʼebe m nọ. Anya m na-ahụzukwa mmehie ha niile.
JER 16:18 Aga m akwụghachi ha okpukpu abụọ nʼihi ajọ omume ha, na mmehie ha, nʼihi na ha ejirila oyiyi ihe arụ a pịrị apị ha, nke na-enweghị ndụ nʼime ya, merụọ ala m. Ha emeekwala ka arụsị bụ ihe arụ jupụta nʼihe nketa m.”
JER 16:19 Onyenwe anyị, ị bụ ike m na ebe m e wusiri ike, ebe mgbaba m nʼoge nsogbu. Mba niile nke ụwa ga-esite na nsọtụ ụwa niile bịakwute gị. Ha ga-abịakwute gị sị gị, “Nna anyị ha enweghị ihe ọbụla karịakwa chi ndị na-abụghị chi nʼezie. Ha bụkwa chi na-abaghị uru, nke na-adịghị ewetara ha ihe ọma ọbụla.”
JER 16:20 Mmadụ ọ pụrụ imere onwe ya chi? E, ma chi ndị ahụ abụghị chi.
JER 16:21 “Ya mere, aga m eme ka ha mata. Nʼoge a ka m ga-eme ka ha mata ike m, na ịdị ike m. Mgbe ahụ, ha ga-amata na aha m bụ Onyenwe anyị.
JER 17:1 “E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda, jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ ya apị, depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha, nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha.
JER 17:2 Ọ bụladị ụmụ ha na-echeta ebe ịchụ aja ha, na ogidi a manyere nʼala nʼihi arụsị Ashera, nke dị nʼebe ọtụtụ osisi ndụ na-etokọ ọnụ, ma nʼelu ugwu nta niile.
JER 17:3 Ugwu m, nke dị nʼala ahụ, na ihe niile ha nwere, na akụnụba ha ka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha. Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu, nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile.
JER 17:4 Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị, nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị. Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị nʼala nke ị na-amaghị, nʼihi na ị kpasuola iwe m, ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”
JER 17:5 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi, onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka, onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ.
JER 17:6 Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu. Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya. Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara, nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị.
JER 17:7 “Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya. Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị.
JER 17:8 Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ. Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ, akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya. Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị. Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.”
JER 17:9 Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile, o nwekwaghị ngwọta. Onye pụrụ ịghọta ya?
JER 17:10 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi, na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ, nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.”
JER 17:11 Dịka ọkwa si ekpokọba akwa ọ na-eyighị, otu a ka ndị na-akpakọba akụ nʼụzọ na-ezighị ezi dị. Nʼetiti ụbọchị ndụ ha, akụ ndị a ga-efunarị ha. Nʼikpeazụ ha ga-aghọ ndị nzuzu.
JER 17:12 Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite, ka ebe nsọ anyị bụ.
JER 17:13 Onyenwe anyị, olileanya Izrel ka ị bụ. A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ. A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala, nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị, isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ.
JER 17:14 Onyenwe anyị, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ. Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara, nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto.
JER 17:15 Ha nọ na-ajụ m ọnụ, na-asị m, “Olee ebe okwu Onyenwe anyị dị? Ya mezuonụ ugbu a!”
JER 17:16 Ma esitebeghị m na ị bụ onye ọzụzụ atụrụ gị wezuga onwe m. Ị maara na ọ bụghị ọchịchọ obi m ịhụ ụbọchị ahụ na-eweta ịda mba. Ị maara ụdị okwu niile na-esite nʼọnụ m na-apụ.
JER 17:17 A ghọrọla m ihe na-eyi egwu, nʼihi na ị bụ ebe mgbaba m nʼụbọchị mbibi.
JER 17:18 Mee ka ihere mee ndị na-akpagbu m. Ekwekwala ka ihere mee m. Mee ka ha tụọ ụjọ, ma chebe m site nʼihe egwu. Mee ka ụbọchị mbibi bịakwasị ha, werekwa okpukpu ihe mbibi abụọ tipịa ha.
JER 17:19 Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzo nʼọnụ ụzọ ama obodo, ebe ndị eze Juda na-esi apụ, ma na-abatakwa. Guzokwa nʼọnụ ụzọ ama ndị ọzọ niile dị na Jerusalem.
JER 17:20 Gwa ha sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda na ndị Juda niile, na ndị niile bi na Jerusalem, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a apụ, na-abatakwa.’
JER 17:21 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu ebughị ibu ọbụla nʼụbọchị izuike; lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu esiteghị nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem bufee ya.
JER 17:22 Unu esitela nʼụlọ unu buputa ihe ọbụla, unu arụkwala ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike. Doonụ ụbọchị izuike nsọ dịka m nyere nna unu ha nʼiwu.
JER 17:23 Ma ha egeghị ntị, maọbụ kpọọ ya mkpa ha. Ha bụ ndị ntị ike, ndị na-adịghị aṅa ntị nʼịdọ aka na ntị, maọbụ nabata ya.
JER 17:24 Ma otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ọ bụrụ na unu ga-elezi anya rubere m isi, hapụ isi nʼọnụ ụzọ ama obodo a bufee maọbụ bubata ibu nʼụbọchị izuike, kama debe ụbọchị izuike nsọ, site na-arụghị ọrụ ọbụla nʼime ya,
JER 17:25 mgbe ahụ, ndị eze ndị ga-anọkwasị nʼocheeze Devid ga-edu ndị na-ejere ya ozi na-agafe na-abatakwa site nʼọnụ ụzọ ama a. Ha na ndị na-ejere ha ozi ga-anọkwasị nʼịnyịnya ha, na nʼụgbọ agha ha, mgbe ha sị nʼọnụ ụzọ ama a na-abata, ma na-apụ. Ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem ga-esokwa ha nʼazụ. Aga m emekwa ka ndị mmadụ biri nʼobodo a ruo mgbe ebighị ebi.
JER 17:26 Ndị mmadụ ga-esite nʼobodo niile nke Juda, na nʼobodo nta gbara Jerusalem gburugburu; ha ga-esitekwa nʼala ndị Benjamin, na nʼala ndagwurugwu nke ugwu ndị ahụ dị nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼala Negev, na-ewebata onyinye aja nsure ọkụ, na aja dị iche iche, na onyinye ọka, na onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na onyinye ekele, nʼime ụlọ Onyenwe anyị.
JER 17:27 Ma ọ bụrụ na unu enupu isi jụ idebe ụbọchị izuike nsọ, ọ bụrụ na unu anọgide na-ebubata ihe site nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼụbọchị izuike, aga m amụnye ọnụ ụzọ ama niile dị na Jerusalem ọkụ, nke a na-apụghị imenyụ emenyụ. Ọ ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike na Jerusalem.’ ”
JER 18:1 Nke a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya.
JER 18:2 “Bilie, jee nʼụlọ ọkpụ ite, ebe ahụ ka m ga-anọ zie gị ozi.”
JER 18:3 Ya mere, ebiliri m jee nʼụlọ ọkpụ ite, bịakwute ya mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ na nkume ịkpụ ihe.
JER 18:4 Ma ite ahụ ọ chọrọ ịkpụ apụtaghị dịka ọkpụ ite si chọọ ya, nʼihi ya, ọ kpụkọtara ụrọ ahụ ọzọ, malitekwa ịkpụgharị ya.
JER 18:5 Mgbe ahụ okwu Onyenwe anyị ruru m ntị,
JER 18:6 Ọ sịrị, “Ọ bụ na m apụghị ime unu dịka ọkpụ ite a mere, unu ụmụ Izrel?” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Dịka ụrọ si dị nʼaka ọkpụ ite ahụ, otu a ka unu onwe unu si dịrị nʼaka m, gị Izrel.
JER 18:7 Mgbe ọbụla m kpọsara na a ga-akwada maọbụ bibie, maọbụ si nʼọnọdụ ya hopu mba maọbụ alaeze ọbụla,
JER 18:8 ọ bụrụ na mba ahụ m dọrọ aka na ntị esite na mmehie ha chegharịa, a gaghị ebibi ya dịka m si zube.
JER 18:9 Ọzọ, ọ bụrụ na m akpọsaa na a ga-ewuli mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla elu, kụọkwa ya,
JER 18:10 ọ bụrụ na o mee ihe jọrọ njọ nʼanya m, jụ irubere m isi, agaghị m emere ya ihe ọma ahụ m zubere imere ya.
JER 18:11 “Ugbu a, gwa ndị Juda na ndị ahụ bi na Jerusalem, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Lee, ana m akwado mbibi nke ga-abịakwasị unu; ana m echekwa echiche ọjọọ megide unu. Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu site nʼụzọ ọjọọ ya chegharịa, ya meekwa ka ụzọ ya na omume ya zie ezi.’
JER 18:12 Ma ha ga-aza sị, ‘O nweghị isi! Anyị ga-anọgide na-eme ihe ọbụla anyị chepụtara nʼechiche anyị, na-emekwa atụmatụ isiike nke obi ọjọọ anyị tụpụtara.’ ”
JER 18:13 Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji kwuo sị, “Jụtanụ ajụjụ nʼetiti mba niile, onye nụrụla ihe dị otu a? Ndị m, Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke emeela ihe jọgburu onwe ya.
JER 18:14 O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn? O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi, nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ?
JER 18:15 Ma ndị m echezọọla m. Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi, bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile. Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie. Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ, nke a na-ewuzighị ewuzi.
JER 18:16 Ala ha ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọ ihe iju anya ruo ebighị ebi. Ndị si nʼakụkụ ya na-agafe ga-efufe isi ha, nʼihi na ihe ha ga-ahụ ga-eju ha anya.
JER 18:17 Aga m achụsa ha nʼihu ndị iro ha dịka ifufe na-efe site nʼọwụwa anyanwụ. Aga m agbakụta ha azụ. Ha agaghị ahụkwa ihu m anya nʼụbọchị ahụ mbibi ga-abịakwasị ha.”
JER 18:18 Ha sịrị, “Bịanụ ka anyị gbaa izu megide Jeremaya, nʼihi na izi iwu agaghị esite nʼebe ndị nchụaja nọ kwụsị, maọbụ ndụmọdụ nʼebe ndị maara ihe, ma ọ bụkwanụ okwu site nʼebe ndị amụma nọ. Ya mere, bịanụ ka anyị were ire anyị buso ya agha, gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ọbụla nke ọ na-ekwu.”
JER 18:19 Gee m ntị, Onyenwe anyị. Nụrụ ihe ndị na-ebo m ebubo na-ekwu megide m.
JER 18:20 O kwesiri iji ajọ omume kwụghachi ihe ọma? Ma lee na ha egwuolara m olulu. Chetakwa na m guzooro nʼihu gị ma rịọ gị arịrịọ nʼihi ha. Arịrịọ m bụ ka ị hapụ iweso ha oke iwe.
JER 18:21 Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ. Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha. Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di. Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha.
JER 18:22 Mee ka e site nʼụlọ ha nụ mkpu akwa, mgbe i mere ka ndị iro ha buso ha agha na mberede. Nʼihi na ha egwuola olulu ijide m, ha esiekwarala m ọnya nzuzo ijide m nʼụkwụ.
JER 18:23 Ma gị onwe gị, Onyenwe anyị, maara nzube ọjọọ ha niile igbu m. Agbagharala ha ajọ omume ha; maọbụ hichapụ mmehie ha site nʼihu gị. Mee ka ụkwụ ha gbuchapụ ka ha daa nʼihu gị; mesie ha ike mgbe ị na-ewe iwe.
JER 19:1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee, zụta otu ite aja site nʼaka ọkpụ ite. Duru ụfọdụ nʼime ndị okenye na ndị nchụaja,
JER 19:2 jee na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nke dị nso nʼọnụ ụzọ ama Ejuju dị nʼọwụwa anyanwụ. Nọdụ nʼebe ahụ kwupụtara ha okwu ndị m gwara gị.
JER 19:3 Sị ha, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda, na ndị Jerusalem. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke Izrel kwuru. Geenụ ntị! Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ala a, ụdị ihe ọjọọ ga-eme ka ntị ọbụla nụrụ ya zụọ wuruwuru.
JER 19:4 Nʼihi na ha ahapụla m, mee ka ebe a ghọọ nke chi ndị mba ọzọ. Ha achụọla aja nsure ọkụ nʼime ya nye chi ndị ahụ ha na nna nna ha, maọbụ ndị eze Juda, na-amaghị. Ha ejirila ọbara ndị aka ha dị ọcha mejupụta ebe a.
JER 19:5 Ha ewuola ebe ịchụ aja dị elu nye chi Baal. Nʼelu ya kwa ka ha na-esure ụmụ ha dịka aja nye Baal, bụ nke m na-enyeghị nʼiwu, ekwughịkwa m ya, o nwekwaghị mgbe o ji bata m nʼobi.
JER 19:6 Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na ụbọchị ahụ na-abịa, ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe ndị mmadụ agaghị akpọkwa ebe a Tofet ma ọ bụkwanụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom, kama a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Ogbugbu.
JER 19:7 “ ‘Nʼebe a ka m ga-anọ laa nzube niile nke Juda na Jerusalem nʼiyi. Aga m eme ka ha daa site na mma agha nʼihu ndị iro ha, nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike. Aga m enye ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ozu ha dịka nri.
JER 19:8 Aga m ebibi obodo a mee ka ọ ghọọ ihe iju anya na ihe ịma ọsụ. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile.
JER 19:9 Aga m emekwa ka ha rie anụ ahụ nke ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Ha ga-erikwa anụ ahụ ibe ha, nʼihi na ndị iro ha ga-agba ha gburugburu nọchibido ha nʼime oke mkpagbu ka ha bibie ndụ ha.’
JER 19:10 “Kụwaa ite ahụ mgbe ndị gị na ha so nọ na-ele gị anya.
JER 19:11 Gwa ha sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sịrị: Aga m etipịa mba a na obodo a, dịka ite aja nke ọkpụ ite a si daa tipịasịa nʼụzọ a na-apụghị imezikwa ya ọzọ. Ha ga-eli ndị nwụrụ anwụ na Tofet tutu ruo mgbe ohere na-agaghị adịkwa ili ozu ọzọ.
JER 19:12 Ihe dị otu a ka m ga-eme nʼebe a, meekwa ndị bi na ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m eme obodo a ka ọ dịrị ka Tofet.
JER 19:13 Ụlọ niile dị na Jerusalem na ụlọ niile nke ndị eze Juda ka a ga-emerụ dịka ebe a, bụ Tofet, otu a ka a ga-esi merụọkwa ụlọ niile a suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ha nye usuu niile nke eluigwe, wụsakwara chi ndị ọzọ ihe ọṅụṅụ dịka onyinye.’ ”
JER 19:14 Mgbe Jeremaya si na Tofet, ebe ahụ Onyenwe anyị zigara ya ibu amụma lọta, o guzoro nʼogige ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ, gwa ndị mmadụ niile okwu sị ha,
JER 19:15 “Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke nke Izrel sịrị, ‘Geenụ ntị! Ana m aga ime ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru okwu ya bịakwasị obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, nʼihi na ha bụ ndị isiike, ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m.’ ”
JER 20:1 Mgbe Pashua nwa Imea, bụ onye nchụaja, ma burukwa onyeisi na-elekọta ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, nụrụ amụma ndị a Jeremaya na-ebu,
JER 20:2 o nyere iwu ka e tie Jeremaya, bụ onye amụma ihe, kee ya agbụ, tinye ya nʼọnụ ụzọ ama Dị Elu nke Benjamin, nke dị ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
JER 20:3 Nʼechi ya, mgbe Pashua tọpụrụ ya site nʼagbụ ahụ, Jeremaya sịrị ya, “Onyenwe anyị akpọghị gị Pashua, kama aha gị bụ Mago-Misabib, nke pụtara, Nwoke ihe egwu gbara gburugburu.
JER 20:4 Nʼihi na nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Aga m eme ka ị ghọọrọ onwe gị, ghọọkwara ndị enyi gị niile ihe egwu. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ha mgbe mma agha ndị iro ha ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-eburu ndị niile bi nʼime ya gaa Babilọn. Ọ ga-egbu ndị fọdụrụ.
JER 20:5 Aga m enyefe ndị iro ha akụ niile dị nʼobodo, na ihe niile ha rụpụtara, na ihe niile dị oke ọnụahịa, na ngwongwo na akụ niile nke ndị eze Juda. Ha ga-eburu ya dịka ihe a kwatara nʼagha laa Babilọn.
JER 20:6 Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’ ”
JER 20:7 Onyenwe anyị, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu nʼaghụghọ. I jidesiela m aka ike, mee ka uche gị mezuo m nʼahụ. Lee na mmadụ niile na-akparị m ụbọchị niile. Onye ọbụla jikwa m na-eme ihe ọchị.
JER 20:8 Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu. Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi. Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile.
JER 20:9 Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.” Ọ dịghị ekwe m. Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi. Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m. Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya. Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya.
JER 20:10 Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo, “Oke egwu nʼakụkụ niile! Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!” Ndị enyi m niile nọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị, “Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere, mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya, bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya.”
JER 20:11 Ma Onyenwe anyị nọnyeere m dịka dike nʼagha; nʼihi ya, ndị na-esogbu m ga-asọ ngọngọ, ha agaghị emerikwa m. Ihe ha zubere agaghị emezuru ha, nʼihi ya, ihere ga-eme ha nke ukwuu; a gaghị echezọkwa ọnọdụ ihere ha ruo ebighị ebi.
JER 20:12 Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume, onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya, biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m.
JER 20:13 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ! Nyenụ Onyenwe anyị otuto! Nʼihi na ọ na-anapụta ndụ ndị mkpa na-akpa, site nʼaka ndị ajọ omume.
JER 20:14 Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ. Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị.
JER 20:15 Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m, nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya, “A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!”
JER 20:16 Ka e meekwa nwoke ahụ ihe Onyenwe anyị mere obodo ndị ahụ o bibiri na-enweghị ọmịiko. Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ, na akwa ibu agha nʼehihie.
JER 20:17 Nʼihi na ọ hapụrụ igbu m mgbe m nọ nʼafọ nne m, hapụ ime ka afọ nne m bụrụ ili m, ka afọ ya bụrụkwa ihe buru ibu ruo mgbe ebighị ebi.
JER 20:18 Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụta ịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị a, na ịnọgide nʼobi mwute, na ịnọ ọnọdụ ihere ogologo ụbọchị niile nke ndụ m?
JER 21:1 Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya ntị mgbe eze Zedekaya zigara Pashua nwa Malkija, na onye nchụaja bụ Zefanaya nwa Maaseia,
JER 21:2 sị, “Jụtara anyị ase site nʼaka Onyenwe anyị, nʼihi na Nebukadneza eze Babilọn na-ebuso anyị agha. Eleghị anya Onyenwe anyị ga-emere anyị ihe ịtụnanya dịka oge gara aga, nke ga-eme ka o si nʼebe anyị nọ wezuga onwe ya.”
JER 21:3 Ma Jeremaya zara sị ha, “Gwanụ Zedekaya sị ya,
JER 21:4 ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: Lee ejikerela m ugbu a ichigharị ihe agha niile dị unu nʼaka, nke unu ji na-ebuso eze Babilọn na ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu agha, e, ejikerela m ichigharị ha megide unu. Aga m akpọbata ha nʼime obodo a.
JER 21:5 Mụ onwe m ga-eji aka e setịpụrụ nke ọma, na aka dị ike, nke iwe na ọnụma dị ukwuu, buo agha megide unu.
JER 21:6 Aga m etida ndị niile bi nʼobodo a, ma mmadụ ma anụ ọhịa. Ha ga-anwụkwa site nʼoke ihe otiti, nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ha.
JER 21:7 Mgbe nke a mesịrị, Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, aga m ewere Zedekaya eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị niile bi nʼobodo a, ndị mma agha na ụnwụ na ihe otiti ndị a na-egbughị, nyefee ha nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, na nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọsi ndụ ha ike. Ọ ga-eji mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere, ọ gaghị egosikwa ha ọmịiko.’
JER 21:8 “Tinyere nke a, gwanụ ndị mmadụ niile, ‘na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m eche nʼihu unu ụzọ abụọ, ụzọ na-eduba na ndụ, na ụzọ na-eduba nʼọnwụ.
JER 21:9 Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya.
JER 21:10 Ekpebiela m imesi obodo a ike; o nweghị ihe ọma ọbụla ga-esi nʼaka m rute ha, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A ga-enyefe obodo a nʼaka eze Babilọn, onye ga-eji ọkụ laa ya nʼiyi.’
JER 21:11 “Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị.
JER 21:12 Unu ụlọ Devid, otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi kwa ụtụtụ niile; napụtanụ ndị a na-emegbu emegbu site nʼaka ndị na-emegbu ha. Napụtakwanụ ndị a na-apụnara ihe ha nwere site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ndị a. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu, dịka ọkụ nʼihi ajọ omume unu, ọ dịkwaghị onye pụrụ ime ka ọ kwụsị.
JER 21:13 Edoola m onwe m megide gị, Jerusalem, gị onye bi nʼebe dị elu karịa ndagwurugwu a, onye bi nʼebe dị elu nke dị larịị, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Gị onye na-asị “Onye pụrụ ibuso anyị agha? Onye kwa pụrụ ịbata nʼebe anyị e wusiri ike?”
JER 21:14 Aga m enye gị ahụhụ nke ruuru gị nʼihi ajọ omume gị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m amụnye ọkụ nʼoke ọhịa gị niile, nke ga-erechapụ ihe niile dị gị gburugburu.’ ”
JER 22:1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee nʼụlọeze Juda nọdụ nʼebe ahụ kwusaa ozi ndị a.
JER 22:2 ‘Nụrụ okwu Onyenwe anyị, nye gị, gị eze Juda, gị onye na-anọkwasị nʼocheeze Devid. Nụrụ ya, gị na ndịisi ọchịchị gị, na unu ndị niile na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụ na-abatakwa.
JER 22:3 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a.
JER 22:4 Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze Devid ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị.
JER 22:5 Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’ ”
JER 22:6 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda, “Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m, dịka elu ugwu ukwu Lebanọn, aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa, dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.
JER 22:7 Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị. Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya. Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile, tụnye ha niile nʼime ọkụ.
JER 22:8 “Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’
JER 22:9 Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ ”
JER 22:10 Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu, kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ. Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ; ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ.
JER 22:11 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ.
JER 22:12 Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.”
JER 22:13 “Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume, nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile, onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu, nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha.
JER 22:14 Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu, nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’ Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ, jirikwa osisi sida machie elu ya, werekwa penti na-acha uhie uhie chọọ ya mma.
JER 22:15 “Ị ga-abụ eze nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ? Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma.
JER 22:16 O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, nke a mere na ihe niile gara nke ọma. Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m? Ka Onyenwe anyị kwupụtara
JER 22:17 Ma anya unu na obi unu adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.”
JER 22:18 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda: “Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’ Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’
JER 22:19 A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu. A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.”
JER 22:20 “Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa, meenụ ka a nụ olu unu na Bashan, sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma.
JER 22:21 Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm, ma ị jụrụ ige ntị. Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ị jụkwara irubere m isi.
JER 22:22 Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile, a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ. Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala nʼihi ajọ omume gị niile.
JER 22:23 Gị onye na-ebi na Lebanọn, onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo, lee ka i si na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị, ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme.
JER 22:24 “Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị,
JER 22:25 were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa.
JER 22:26 Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ.
JER 22:27 Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.”
JER 22:28 Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị, ihe onye ọbụla na-achọghị? Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya, tụga ha na mba ha na-amaghị?
JER 22:29 Ala, ala, ala, nụrụ okwu Onyenwe anyị.
JER 22:30 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: “Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa, nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile, nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma, o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze Devid, maọbụ chịakwa ọzọ na Juda.”
JER 23:1 “Ahụhụ dịrị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-achụsasị, ma na-ebibi igwe atụrụ m ha kwesiri ilekọtazi anya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 23:2 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 23:3 “Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.
JER 23:4 Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 23:5 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya. Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.
JER 23:6 Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda, Izrel ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya: Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.
JER 23:7 “Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’
JER 23:8 ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.”
JER 23:9 Ma banyere ndị amụma, obi m na-agbawa nʼime m, ọkpụkpụ m na-amakwa jijiji nʼihi ha. Adị m dịka nwoke mmanya na-egbu, dịka onye ṅụbigara mmanya oke, nʼihi ihe na-eche ha site nʼaka Onyenwe anyị, na site nʼokwu nsọ ya.
JER 23:10 Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko. Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu, ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla. Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ. Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi.
JER 23:11 “Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke. Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 23:12 “Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị; a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrị ebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa. Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị ha nʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
JER 23:13 “Ahụrụ m ihe arụ nʼetiti ndị amụma Sameria: Ha buru amụma site nʼike chi Baal, si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie.
JER 23:14 Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya nʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem. Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha. Ha na-agba ndị ajọ omume ume, si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa. Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ; ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.”
JER 23:15 Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a, “Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu, meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi, nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.”
JER 23:16 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma, nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya. Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha, o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha
JER 23:17 Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha, ‘Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’ Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara, ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’
JER 23:18 Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru Onyenwe anyị nso, hụ ya anya maọbụ ịnụ ihe ọ na-ekwu? Onye kwa nʼetiti ha nwerela ike ṅaa ntị nụrụ okwu ya?
JER 23:19 Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike, ọ bụ oke ifufe nke iwe ya, nke ga-abịa bufuo ndị ajọ omume a.
JER 23:20 Onyenwe anyị agaghị akwụsị iwe iwe ya tutu ruo mgbe o mezuru ihe niile dị ya nʼobi. Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa nʼihu, unu ga-aghọta ihe ndị a niile nke ọma.
JER 23:21 Ọ bụghị m zitere ndị amụma a, ma ha na-ekwu na ọ bụ okwu si m nʼọnụ ka ha na-ekwu. O nwebeghị oge m ji gwa ha okwu, ma ha nọkwa na-ebu amụma.
JER 23:22 A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m, ha gaara ekwusara ndị m okwu m, nke gaara eme ka ha site nʼajọ omume ha tụgharịa, sitekwa nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
JER 23:23 “Abụ m naanị Chineke na-anọ ha nso, ma adịghị m anọ nʼebe dị anya?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 23:24 “O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzo nke m na-enweghị ike ịhụ anya?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 23:25 “Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’
JER 23:26 Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi?
JER 23:27 Ha na-eche na nrọ ha na-akọrịtara ibe ha ga-eme ka ndị mmadụ chezọọ aha m, dịka ndị nna nna ha si chezọọ aha m site nʼịkpọ isiala nye Baal.
JER 23:28 Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 23:29 “Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe nke na-etiwasị nkume?”
JER 23:30 Nʼihi ya, Onyenwe anyị kwubiri sị, “Ana m edo onwe m megide ndị amụma na-esite nʼọnụ ibe ha na-ezute okwu ha na-ekwu, ma na-asị na ọ bụ nʼọnụ m ka ha si nata ya.
JER 23:31 E, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, Ana m edo onwe m megide ndị amụma ahụ ire ha na-ekwu ọtụtụ okwu, ndị ahụ na-asịkwa, ‘Ọ bụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.’
JER 23:32 Nʼezie, ana m edo onwe m megide ndị ahụ niile na-ebu amụma nro ụgha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ji okwu ụgha ha na-agwa ndị m okwu, na-eduhie ha, ma ọ bụghị m họpụtara ha. Ọ bụkwaghị m zitere ha. Okwu ha adịghịkwa abara ndị m uru ọbụla.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 23:33 “Mgbe ndị a, maọbụ ndị amụma ha, maọbụ ndị nchụaja ha, jụrụ gị ajụjụ sị gị, ‘Gịnị bụ ozi i si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’ Ị ga-asa ha sị, ‘Ozi nke ole? Aga m agbakụta unu azụ, ya bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.’
JER 23:34 Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye nchụaja maọbụ onye ọbụla ọzọ ekwuo sị, ‘Ihe dị otu a bụ ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị,’ aga m ata onye ahụ kwuru okwu ahụ na ndị ezinaụlọ ya ahụhụ.
JER 23:35 Ihe ndị a bụ ihe unu na-agwarịta onwe unu nʼotu nʼotu. Ọ bụ ihe enyi na-agwa enyi ya, na ihe nwanna na-agwa nwanna Izrel ibe ya. Unu na-asị, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere?’ maọbụ, ‘Gịnị bụ okwu e si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’
JER 23:36 Kwụsịnụ ịjụgharị ajụjụ banyere ihe Onyenwe anyị kwuru, nʼihi na okwu onye ọbụla nʼime unu kwuru na-aghọrọ onye ahụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. Site nʼụzọ dị otu a unu na-agbanwe ma na-asụgharịkwa okwu Chineke dị ndụ isi, bụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke anyị.
JER 23:37 Ihe ndị a niile bụ ihe unu na-ajụkarị onye amụma, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere gị? Maọbụ, gịnị ka Onyenwe anyị kwuru?’
JER 23:38 Ọ bụ ezie na unu na-ekwu sị, ‘Ihe ndị a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ma lee ihe Onyenwe anyị na-ekwu: Unu na-ekwu okwu ndị a, ‘Ihe a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ọ bụladị mgbe m gwarala unu si unu asịkwala ‘Ihe ndị a bụ ozi nʼaka Onyenwe anyị.’
JER 23:39 Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha.
JER 23:40 Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu.”
JER 24:1 Emesịa, Onyenwe anyị gosiri m nkata fiig abụọ, nke a dọbara nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼoge a, Nebukadneza eze Babilọn esitelarị na Jerusalem dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, eze Juda, na ndịisi Juda, na ndị ọka, na ndị ụzụ, mee ka ha gaa biri na Babilọn, nke dị na mba ọzọ.
JER 24:2 Otu nkata nwere mkpụrụ fiig mara mma, dịka ndị ahụ na-ebu ụzọ acha, nkata nke ọzọ nwere mkpụrụ fiig nke jọrọ njọ, ha jọrọ njọ na mmadụ enweghị ike ịracha ha.
JER 24:3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụrụ m ajụjụ sị m, “Jeremaya, gịnị ka ị hụrụ?” Azara m sị ya, “Ahụrụ m mkpụrụ fiig. Ụfọdụ dị nnọọ ezi mma, ma ndị ọzọ jọrọ njọ. Ha adịghịkwa mma nracha.”
JER 24:4 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
JER 24:5 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel kwuru: Ndị ahụ m mere ka e si na Juda dọta nʼagha, ndị e buuru gaa nʼala Kaldịa dị m dịka mkpụrụ osisi fiig ndị a mara mma.
JER 24:6 Anya m ga-adịkwasị ha nʼahụ ịhụ na ihe gaara ha nke ọma. Aga m akpọghachitekwa ha nʼala a. Aga m ewulikwa ha elu ghara ikwada ha; Aga m akụ ha dịka osisi ghara ihopu ha.
JER 24:7 Aga m enye ha ụdị obi ha ga-eji mata m, na m bụ Onyenwe anyị. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Nʼihi na obi ha niile ka ha ga-eji lọghachikwute m.
JER 24:8 “ ‘Ma dịka fiig ọjọọ ndị a, bụ ndị dị njọ nke ukwuu na-enweghị ike iri ha eri,’ Onyenwe anyị sịrị, ‘otu a ka m gaa emeso Zedekaya, eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ahụ niile fọdụrụ ndụ na Jerusalem, ma ha bi nʼime ya, maọbụ biri nʼIjipt.
JER 24:9 Aga m eme ka ha ghọọrọ alaeze niile nke ụwa ihe ịsọ oyi, na ihe na-eweta obi ọjọọ. Ha ga-aghọ ihe ịta ụta, na ihe e ji akọ akụkọ, na ihe nkọcha na ihe ịbụ ọnụ nʼebe ọbụla m mere ka ha gaa biri.
JER 24:10 Aga m ezigakwa mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe nʼetiti ha, tutu ruo mgbe e mere ka ha gwụsịa nʼelu ala ahụ nke m nyere ha, nyekwa ndị bụ nna nna ha.’ ”
JER 25:1 Okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juda niile, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Jehoiakim, nwa Josaya na Juda. Ọ bụkwa nʼafọ nke mbụ nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn.
JER 25:2 Ya mere, ihe ndị a ka Jeremaya, bụ onye amụma gwara ndị Juda na ndị niile bi na Jerusalem:
JER 25:3 Kemgbe afọ iri abụọ na atọ, sitekwa nʼafọ iri na atọ nke ọchịchị eze Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda ruo taa, ka okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, a gwara m unu okwu, mgbe na mgbe, ma unu jụrụ ige ntị nʼihe m gwara unu.
JER 25:4 Ọ bụkwa ezie na Onyenwe anyị eziterela unu ndị ohu ya bụ ndị amụma site nʼoge ruo nʼoge ma unu ajụla ige ntị. Unu jụkwara ịṅa ntị nʼihe ha na-ekwu.
JER 25:5 Ozi ha ziri unu bụ nke a, “Unu niile nʼotu nʼotu sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ndụ ọjọọ unu tụgharịa, ka unu nwee ike ibigide nʼala a Onyenwe anyị nyere unu na nna nna unu ha ruo mgbe ebighị ebi.
JER 25:6 Unu agbasola maọbụ fee, maọbụ kpọọ isiala nye chi ndị ọzọ; unu ejila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, ka m ghara imerụ unu ahụ.
JER 25:7 “Ma unu jụrụ ige m ntị,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Unu ejirila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, si otu a wetara onwe unu mmerụ ahụ.”
JER 25:8 Ya mere, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-asị, “Ebe ọ bụ na unu ajụla ige ntị nʼokwu m.
JER 25:9 Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
JER 25:10 Aga m emekwa ka olu obi ụtọ na ọṅụ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị na-akwọ ọka, na ìhè nke oriọna na-enye, hapụkwa ịdị nʼime ya.
JER 25:11 Ala a niile ga-aghọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, mba ndị a niile ga-ejere eze Babilọn ozi iri afọ asaa.
JER 25:12 “Ma mgbe iri afọ asaa zuru, aga m ata eze Babilọn na mba ya, bụ ala ndị Babilọn, ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m emekwa ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
JER 25:13 Aga m emekwa ka ihe niile m buru ụzọ kwuo megide ala ahụ bịakwasị ya, bụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ a, na ihe niile Jeremaya buru nʼamụma megide mba niile dị iche iche.
JER 25:14 A ga-eme ka ha ghọọ ndị ohu nye mba dị iche iche na nke ndị eze dị ukwuu. Aga m akwụghachikwa ha dịka omume ha si dị, na dịka akaọrụ ha si dịkwa.”
JER 25:15 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel gwara m, “Nara m iko a dị m nʼaka, nke a gbajuru mmanya ọnụma m, gaa mee ka mba niile m zigara gị ijekwuru ṅụrụ site na mmanya ọnụma m dị nʼime ya.
JER 25:16 Mgbe ha ṅụrụ ya, ha ga-adagharị, malitekwa ịyị ara nʼihi mma agha, nke m ga-ezite nʼetiti ha.”
JER 25:17 Ya mere, esi m nʼaka Onyenwe anyị nara iko ahụ, meekwa ka mba ndị ahụ niile o ziri m ka m jekwuru ṅụrụ ihe dị nʼime ya.
JER 25:18 Jerusalem na obodo Juda niile, na ndị eze ha, na ndịisi ọchịchị ha, si nʼiko ahụ ṅụrụ ihe dị nʼime ya, nʼihi ime ka e bibie ha, ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe a bụrụ ọnụ, dịka ha dị taa.
JER 25:19 Fero, eze Ijipt, na ndị na-ejere ya ozi, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ya niile,
JER 25:20 na ndị mba ọzọ niile bi nʼebe ahụ; na ndị eze Uz; na ndị eze ndị Filistia niile, bụ nke ndị Ashkelọn, na Gaza, na Ekrọn, na ndị fọdụrụ nʼime Ashdọd.
JER 25:21 Ndị eze Edọm, na Moab, na ndị Amọn;
JER 25:22 na ndị eze Taịa na Saịdọn, na ndị eze obodo ha dị nʼakụkụ osimiri, nke dị nʼofe nke ọzọ;
JER 25:23 na ala Dedan, na Tema, na Buz, na ndị niile bi nʼebe dị anya.
JER 25:24 Na ndị eze Arebịa, na ndị eze mba niile ndị ahụ bi nʼọzara;
JER 25:25 na ndị eze Zimri, na Elam, na Midia;
JER 25:26 na ndị eze ala dị nʼugwu, na mba dị nso, na mba dị anya, ha niile nʼotu nʼotu, na alaeze niile dị nʼụwa. Mgbe eze ndị a niile ṅụtụrụ site nʼihe dị nʼiko ahụ, eze Sheshak ga-esitekwa na ya ṅụrụ.
JER 25:27 “Mgbe ahụ, gwakwa ha sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ṅụọnụ, ṅụbiganụ oke; gbọọkwanụ agbọọ, daanụ nʼala ebe unu na-agaghị esi bilitekwa ọzọ, nʼihi mma agha m ga-ezite nʼetiti unu.’
JER 25:28 Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
JER 25:29 Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
JER 25:30 “Ugbu a buo amụma ndị a niile megide ha, sị ha, “ ‘Onyenwe anyị ga-esi nʼelu bigbọọ; ọ ga-esitekwa nʼebe obibi ya dị nsọ mee ka olu ya daa ụda. Ọ ga-ebigbọsị ike megide ala ya Ọ ga-eti mkpu dịka ndị ahụ na-azọcha mkpụrụ vaịnị; ọ ga-eti mkpu megide ndị niile bi nʼụwa.
JER 25:31 Ụda mkpọtụ ahụ ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebo mba niile nke ụwa ebubo. Ọ ga-eme ka ikpe ọmụma rute mmadụ niile, meekwa ka e jiri mma agha bibie ndị ajọ omume.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 25:32 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, mbibi na-agbasa site nʼotu mba na-eru na mba ọzọ; oke ifufe na-abịakwa site na nsọtụ niile nke ụwa.”
JER 25:33 Nʼoge ahụ, ndị ahụ Onyenwe anyị ga-egbu ga-atọgbọrọ nʼebe niile, site nʼotu nsọtụ nke ụwa ruo na nke ọzọ. A gaghị eli ha, o nwekwaghị onye ga-akwa ha. Kama ha ga-atọgbọrọ nʼala dịka unyi.
JER 25:34 Kwasienụ akwa ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu akwa; tụrụọnụ onwe unu nʼala, unu ndị ndu nke igwe ewu na atụrụ. Nʼihi na oge a ga-egbu unu eruola, unu ga-adakwa tiwasịa dịka ite aja.
JER 25:35 Ndị ọzụzụ atụrụ agaghị enwe ebe ha ga-agbaga ọsọ; ndị ndu igwe ewu na atụrụ agaghị enwekwa ebe ha ga-ezo onwe ha.
JER 25:36 Geenụ ntị ka unu nụrụ ịkwa akwa ndị ọzụzụ atụrụ, geenụ ntị nụrụ mkpu akwa ndị ndu igwe ewu na atụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-ebibi ebe ịta nri ha.
JER 25:37 Ebe mmakpu ọma niile nke anụ ụlọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi oke iwe nke Onyenwe anyị.
JER 25:38 Ọ ga-apụkwute ha, dịka ọdụm si esi nʼebe ndina ya na-apụta ịchụ anụ ọhịa. Ọ ga-eme ka ala ha ghọọ mkpọmkpọ ebe, nʼihi mma agha nke onye mmegbu, na nʼihi oke iwe Onyenwe anyị.
JER 26:1 Na mmalite oge ahụ, Jehoiakim nwa Josaya eze Juda bidoro ịchị ndị Juda, Onyenwe anyị mere ka okwu ya rute Jeremaya ntị.
JER 26:2 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Guzo nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nọdụ nʼebe ahụ gwa ndị niile si nʼobodo Juda bịa ịkpọ isiala nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu. Gwa ha ihe ahụ niile m nyere gị nʼiwu. Mee ka ihe ndị ahụ niile m nyere gị nʼiwu rute ha ntị, na-afọdụghị otu.
JER 26:3 Ma eleghị anya ha ga-anụ, si na mmehie ha chegharịa. Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ m na-ezube na ọ ga-abịakwasị ha ghara ịbịakwasị ha.
JER 26:4 Gwa ha sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa ịgbaso iwu m, nke m nyere unu.
JER 26:5 Ọ bụrụkwa na unu ajụ ige ntị nʼokwu ndị ohu m bụ ndị amụma ahụ m ziteere unu site nʼoge ruo nʼoge (ndị unu nọgidekwara jụ ige ntị),
JER 26:6 mgbe ahụ, aga m eme ka ụlọnsọ a dịrị ka Shaịlo. Aga m emekwa ka obodo a bụrụ obodo a bụrụ ọnụ nʼetiti mba niile dị nʼụwa.’ ”
JER 26:7 Ndị nchụaja, na ndị amụma, na ndị mmadụ ndị ọzọ nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nụrụ mgbe Jeremaya kwuru okwu ndị a niile.
JER 26:8 Mgbe Jeremaya kwusiri okwu ndị ahụ Onyenwe anyị sị ya kwuo, ndị nchụaja ahụ, na ndị mmadụ ndị ọzọ, na ndị amụma ahụ niile, jidere ya sị ya, “Ị ghaghị ịnwụ!
JER 26:9 Gịnị mere i ji buo amụma na ụlọnsọ a ga-adị ka Shaịlo? Gịnịkwa mere i ji akwado na obodo a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke onye ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya?” Nʼoge ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gbara Jeremaya gburugburu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
JER 26:10 Mgbe ndịisi ọchịchị Juda nụrụ ihe ndị a na-eme, ha sitere nʼụlọeze bilie pụọ, jee nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha weere ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
JER 26:11 Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị amụma gwara ndịisi ọchịchị ahụ okwu sị ha: “O kwesiri ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ, nʼihi na o buru amụma megide obodo a. Unu onwe unu ji ntị unu nụrụ ihe o kwuru.”
JER 26:12 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndịisi ọchịchị ahụ na mmadụ niile nọ nʼebe ahụ okwu sị ha, “Ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ibu amụma megide ụlọnsọ a na obodo a. Okwu niile m kwuru, nke unu nụrụ, bụ ihe Onyenwe anyị ziri m ikwu.
JER 26:13 Ma ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu zie ezi, ọ bụrụ na unu erube isi nye Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ o zubere na ọ ga-abịakwasị unu ghara ịbịakwasị unu.
JER 26:14 Ma nʼebe mụ onwe m nọ, lee adị m unu nʼaka, jirinụ m mee ihe ọbụla ziri unu ezi nʼanya nke dịkwa mma nʼanya unu.
JER 26:15 Ma ghọtakwanụ nke ọma, na ọ bụrụ na unu emee ka m nwụọ, unu ga-eweta ikpe ọmụma nke igbu onye aka ya dị ọcha nʼisi unu. Ikpe ọmụma ga-adịkwara obodo a na ndị bi nʼime ya, nʼihi na eziokwu, Onyenwe anyị zitere m ikwupụta na ntị unu okwu ndị a niile.”
JER 26:16 Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị na ndị mmadụ ahụ niile gwara ndị nchụaja na ndị amụma okwu sị ha, “O kwesighị ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ nʼihi na ọ gwara anyị okwu site nʼaha Onyenwe anyị Chineke anyị.”
JER 26:17 Ụfọdụ nʼime ndị okenye nọ nʼebe ahụ pụtara nʼihu ọha mmadụ ahụ gwa ha okwu sị,
JER 26:18 “Maịka onye Moreshet buru amụma nʼoge Hezekaya, bụ eze Juda. Ọ gwara ndị Juda niile, sị ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “ ‘A ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi. Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.’
JER 26:19 “Hezekaya bụ eze Juda, na ndị Juda niile, ha mere ya ka ọ nwụọ? Hezekaya ọ tụghị egwu Onyenwe anyị, rịọọ amara na ihuọma ya? Ọ bụ na Onyenwe anyị atụgharịghị uche, mee ka ihe ọjọọ o kwuru megide ya gharakwa imezu? Ma anyị na-achọ iwetara onwe anyị ihe ọjọọ nke oke mbibi.”
JER 26:20 (Ụraya nwa Shemaya, onye si Kiriat Jearim pụta, bụkwa onye ọzọ buru amụma site nʼaha Onyenwe anyị. Amụma o buru megide obodo a na ala a bụkwa ụdị amụma nke Jeremaya na-ebu.
JER 26:21 Mgbe Jehoiakim bụ eze na ndịisi ọchịchị nụrụ amụma Ụraya na-ebu, ha gbalịrị ijide ya gbuo ya, ma Ụraya nụrụ ihe ha zubere ime. Ya mere, Ụraya nụrụ ya gbapụ ọsọ gbalaa Ijipt nʼihi egwu.
JER 26:22 Ma eze bụ Jehoiakim, zipụrụ Elnatan nwa Akboa na ụfọdụ ndị ikom ọzọ ka ha gaa Ijipt jide Ụraya.
JER 26:23 Ha si nʼIjipt kpọlata Ụraya, duru ya gaa nʼihu Jehoiakim bụ eze, onye nyere iwu ka e jiri mma agha gbuo ya. A tụnyere ozu ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu nʼala ahụ.)
JER 26:24 Ma otu ọ dị, Ahikam nwa Shefan, dịnyeere Jeremaya, nʼihi ya a raraghị Jeremaya nye nʼaka ndị mmadụ ka ha gbuo ya.
JER 27:1 Na mmalite ọchịchị Zedekaya, nwa Josaya eze Juda, okwu ndị a si nʼọnụ Onyenwe anyị rute Jeremaya ntị.
JER 27:2 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Jiri akpụkpọ anụ dị warawara na ụfọdụ okporo igwe, meere onwe gị ụdị agbụ ahụ a na-amanye ụmụ ehi nʼolu, nyakwasị ya nʼolu gị.
JER 27:3 Mgbe ahụ, zigara ndị eze Edọm, na Moab, na Amọn, na Taịa, na Saịdọn ozi site nʼọnụ ndị ozi ha bịara Jerusalem iwetara Zedekaya eze Juda ozi.
JER 27:4 Zie ha ozi ha ga-ezi ndị nwe ha, sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, sị, “Zienụ ndị nna unu ukwu ozi a, sị,
JER 27:5 Ọ bụ site nʼike aka m, na site nʼogwe aka m, nke e setịrị eseti, ka m ji mee ụwa, na mmadụ, na anụmanụ dị nʼime ya. Mụ onwe m ka ọ dịkwara ikpebi itinye ha niile nʼaka onye ọbụla m họpụtara dịka o si dị m mma.
JER 27:6 Ugbu a, ana m ewere alaeze unu niile nyefee ya nʼaka onye na-ejere m ozi bụ Nebukadneza eze Babilọn; aga m emekwa ka ọ bụladị ụmụ ajọ anụ ọhịa mee ihe o nyere nʼiwu.
JER 27:7 Mba niile ga-akpọ isiala nye ya; ha ga-akpọkwa isiala nye nwa ya na nwa nwa ya, tutu ruo mgbe m kpebiri na oge ha ezuola. Mgbe ahụ, aga m eme ka ọtụtụ mba na ọtụtụ ndị eze merie ya.
JER 27:8 “ ‘ “Ma ọ bụrụkwa na mba maọbụ alaeze ọbụla ajụ ife Nebukadneza, bụ eze Babilọn, maọbụ jụ ijere ya ozi dịka ohu, aga m eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe, taa mba ahụ ahụhụ, tutu ruo mgbe m bibiri ya site nʼaka ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 27:9 Ya mere, unu aṅala ndị amụma unu, na ndị na-ajụ mmụọ ase, na ndị na-akọwara unu nrọ, na ndị mmụọ ọjọọ si nʼọnụ ha ekwu okwu, na ndị mgbaasị ntị. Unu aṅala ha ntị mgbe ha na-asị unu, ‘Unu agaghị abụ ndị ohu eze Babilọn.’
JER 27:10 Nʼihi na ọ bụ naanị amụma ụgha ka ha na-eburu unu, okwu ụgha nke ga-eme ka e site nʼala unu wezuga unu, bulaa unu ala dị anya. Aga m esi nʼala unu chụsaa unu. Unu ga-alakwa nʼiyi.
JER 27:11 Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ekwere ịbụ ohu eze Babilọn, kwenyekwa ife ya ofufe, mba ahụ ka m ga-eme ka ọ nọgide nʼala nke aka ya. Ọ ga-akọ ala ahụ, birikwa nʼime ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.” ’ ”
JER 27:12 Otu ozi ahụ ka m ziri Zedekaya, bụ eze Juda. Asịrị m, “Were olu gị nyefee eze Babilọn nʼaka dịka ohu, feekwa ya na ndị ya, ị ga-adịkwa ndụ.
JER 27:13 Nʼihi gịnị ka gị na ndị gị ga-eji nwụọ site na mma agha, na site nʼụnwụ na ọrịa na-efe efe, dịka nke Onyenwe anyị kwurula banyere mba ọbụla nke na-agaghị efe eze Babilọn?
JER 27:14 Egela ntị nʼokwu ndị amụma na-agwa gị sị, ‘Unu agaghị efe eze Babilọn,’ nʼihi na ọ bụ okwu ụgha ka ha na-agwa unu.
JER 27:15 ‘Ọ bụghị m zitere ha,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ha ji aha m na-ebu amụma ụgha. Nʼihi ya, aga m achụpụ unu, unu ga-alakwa nʼiyi, unu na ndị amụma ahụ na-eburu unu amụma.’ ”
JER 27:16 Mgbe ahụ, agwara m ndị nchụaja na ndị mmadụ niile okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Unu egela ndị amụma ahụ ntị, bụ ndị na-asị unu, ‘Na mgbe na-adịghị anya a ga-ebughachi ngwongwo ahụ e si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bulaa Babilọn.’ Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.
JER 27:17 Unu egela ha ntị. Feenụ eze Babilọn, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼụzọ ahụ ka unu ga-esi dịrị ndụ. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji kwenye ka obodo a ghọọ mkpọmkpọ ebe?
JER 27:18 Ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ ndị amụma a na-apụta, ha rịọọnụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile arịrịọ ka ọ hapụ ikwe ka e bukọrọ ngwongwo fọdụrụ nʼime ụlọnsọ nakwa ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda, na nʼime Jerusalem bulaa Babilọn.
JER 27:19 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ogidi niile ndị ahụ, na Oke osimiri bronz ahụ, na ihe ndọkwasị niile, na ihe niile fọdụrụ nʼobodo a,
JER 27:20 nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn na-eburughị mgbe o sitere na Juda na Jerusalem, dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, bụ eze Juda, na ndị niile a na-asọpụrụ bulaa Babilọn.
JER 27:21 E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru banyere ihe niile fọdụrụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda na nʼime Jerusalem.
JER 27:22 ‘A ga-eburu ha niile bulaa ha Babilọn. Ebe ahụ ka ha ga-anọkwa tutu ruo mgbe m ga-abịa leta ha,’ ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Mgbe ahụ, aga m ebulatakwa ha, kpọghachitekwa ha nʼebe a.’ ”
JER 28:1 O ruo, nʼọnwa nke ise nke otu afọ ahụ, nke bụ afọ nke anọ, na mmalite ọchịchị Zedekaya eze Juda, Hananaya, nwa Azoa, onye amụma si Gibiọn, gwara m okwu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ si m.
JER 28:2 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Aga m agbaji agbụ nke eze Babilọn.
JER 28:3 Tupu afọ abụọ agabiga, aga m esi Babilọn bulata ihe ndị ahụ niile Nebukadneza eze Babilọn si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ bulaa Babilọn.
JER 28:4 Aga m akpọlatakwa Jehoiakin nwa Jehoiakim, na ndị niile ọzọ e si na Juda dọta nʼagha bulaa Babilọn, nʼihi na aga m agbaji agbụ ahụ eze Babilọn nyanyere ha nʼolu.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 28:5 Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma zara Hananaya onye amụma nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ niile guzo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị
JER 28:6 Jeremaya onye amụma sịrị, “Amen! Ka Onyenwe anyị mezuo okwu amụma a i buru site na ibughachite ngwongwo ụlọ Onyenwe anyị na ịkpọghachite ndị niile e mere ka ha si nʼebe a gaa biri na Babilọn.
JER 28:7 Ma gee ntị nụrụ ihe m ga-ekwu nʼihu gị na nʼihu ndị a niile guzo nʼebe a.
JER 28:8 Site na mgbe ochie, ndị amụma ahụ bu mụ na gị ụzọ ebuola amụma banyere agha na mbibi na ọrịa na-efe efe megide ọtụtụ obodo dị iche iche, na ọtụtụ alaeze dị iche iche.
JER 28:9 Ma ihe e ji amata na ọ bụ Onyenwe anyị nʼezie, zitere onye amụma buru amụma kwuo na udo ga-adị, bụ naanị ma ọ bụrụ na amụma ya emezuo.”
JER 28:10 Mgbe ahụ, Hananaya bụ onye amụma yipụrụ Jeremaya agbụ ahụ o yikwasịrị onwe ya nʼolu gbajie ya.
JER 28:11 Ọ sịrị nʼihu ọha mmadụ ahụ niile, “Nke a ka Onyenwe anyị kwuru: ‘Ọ bụ nʼotu aka ahụ ka m ga-agbajipụkwa agbụ ịyagba Nebukadneza, eze Babilọn nyanyere nʼolu mba niile tupu afọ abụọ agabiga.’ ” Mgbe o kwuru otu a, Jeremaya onye amụma hapụrụ ebe ahụ laa.
JER 28:12 Mgbe Hananaya bụ onye amụma gbajisiri ịyagba ahụ Jeremaya, onye amụma nyanyere onwe ya nʼolu, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
JER 28:13 “Gaa gwa Hananaya okwu sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ị gbajiela agbụ e ji osisi mee, ma nʼọnọdụ ya ihe ị ga-enweta bụ agbụ igwe.
JER 28:14 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru. Aga m anyanye mba ndị a niile agbụ igwe, i mee ka ha fee Nebukadneza eze Babilọn. Ha ga-efekwa ya. Aga m enyekwa ya ike ọ bụladị nʼebe ụmụ anụ ọhịa dị.’ ”
JER 28:15 Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma sịrị Hananaya onye amụma, “Gee ntị, Hananaya! Ọ bụghị Onyenwe anyị zitere gị, ma ị ghọgbuola mba a mee ka ha tụkwasị uche nʼokwu ụgha.
JER 28:16 Nʼihi nke a, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ekpebiela m isite nʼụwa wepụ gị. Ị ga-anwụ nʼafọ a, nʼihi na i kwusaala nnupu isi megide Onyenwe anyị.’ ”
JER 28:17 Nʼọnwa asaa nke afọ ahụ Hananaya onye amụma nwụrụ.
JER 29:1 Ihe ndị a bụ ihe dị nʼakwụkwọ ozi Jeremaya onye amụma si Jerusalem degaara ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị okenye, na ndị nchụaja, na ndị amụma, na ndị Izrel Nebukadneza dọtara nʼagha si na Jerusalem bulaa ha Babilọn.
JER 29:2 Nke a bụ mgbe eze Jehoiakin, nne eze, ndị ozi nʼụlọeze, ndị ndu Juda na Jerusalem, ndị ọka, na ndị ụzụ sitere na Jerusalem dọta ha nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.
JER 29:3 Onye Jeremaya nyere akwụkwọ ozi a ka o nyeruo ndị e deere ya bụ Eleasa nwa Shefan, na Gemaraya nwa Hilkaya, ndị Zedekaya eze Juda zigara Babilọn izi Nebukadneza bụ eze ozi.
JER 29:4 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-agwa ndị niile m mere ka e si na Jerusalem dọta nʼagha buru laa Babilọn,
JER 29:5 “Wuoronụ onwe unu ụlọ, birikwanụ nʼime ya; kụọnụ ihe nʼubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya;
JER 29:6 lụọnụ nwunye, mụọkwanụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom; lụọkwaranụ ụmụ unu ndị ikom nwunye, kwenyekwanụ ka ụmụ unu ndị inyom lụọ di, ka ha mụọkwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Mụbaanụ nʼebe ahụ, unu ebilatakwala.
JER 29:7 Chọọnụ udo nke obodo ahụ m mere ka unu gaa biri nʼime ya. Kpeekwanụ ekpere nye Onyenwe anyị banyere ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ihe agaara obodo ahụ nke ọma, ọ ga-agakwara unu nke ọma.”
JER 29:8 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru, “Unu ekwela ka ndị amụma ahụ nọ nʼetiti unu, na ndị na-ajụ arụsị ase rafuo unu; unu egela ntị nʼakụkọ ha na-akọ banyere nrọ ndị ahụ unu na-akwagide ha ka ha rọọ.
JER 29:9 Nʼihi na amụma ha na-ebu nʼaha m bụ amụma ụgha. Ọ bụkwaghị m zitere ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 29:10 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Mgbe iri afọ asaa m kwadoro maka Babilọn zuru, aga m abịa mezuo nkwa ahụ m kwere. Aga m eme ka unu lọtakwa nʼebe a.
JER 29:11 Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu,” ka Onyenwe anyị kwubiri, “echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.
JER 29:12 Mgbe ahụ, unu ga-abịakwute m, unu ga-abịa kpọkuokwa m nʼekpere, aga m egekwa unu ntị.
JER 29:13 Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.
JER 29:14 Aga m emekwa ka unu chọta m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “meekwa ka unu bụ ndị a dọtara nʼagha lọta. Aga m esitekwa na mba ahụ niile m chụgara unu chịkọtaa unu, kpọghachitekwa unu nʼebe ahụ m si chụpụ unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
JER 29:15 Unu pụrụ ị sị, “Onyenwe anyị akpọlite ndị amụma nye anyị na Babilọn.”
JER 29:16 Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu banyere eze ahụ na-anọkwasị nʼocheeze Devid, na banyere ndị mmadụ niile fọdụrụ nʼobodo a, bụ ụmụnne unu ndị ahụ na-esoghị unu gaa ebe e mere ka ha ga biri na mba ọzọ.
JER 29:17 E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m eziga mma agha nʼetiti ha, zigakwa ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Aga m eme ha ka ha dị ka mkpụrụ fiig jọgburu onwe ya, nke mmadụ na-agaghị ata ata.
JER 29:18 Aga m eji mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, chụọ ha ọsọ. Aga m eme ha ka ha bụrụ ihe alaeze niile nke ụwa ga na-asọ oyi. Ha ga-abụ ihe ịbụ ọnụ, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe ịta ụta nʼetiti mba niile ebe m ga-achụla ha ọsọ.
JER 29:19 Nʼihi na ha egeghị ntị nʼokwu m, bụ okwu si nʼọnụ ndị ohu m bụ ndị amụma, ndị m zigaara ha mgbe mgbe. Ma unu onwe unu, ndị bi na mba ọzọ egekwaghị ntị nʼokwu m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 29:20 Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu niile bụ ndị m mere ka e si na Jerusalem dọta nʼagha gaa Babilọn.
JER 29:21 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-ekwu banyere Ehab nwa Kolaya, na Zedekaya nwa Maaseia, ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m, “Aga m ewere ha nyefee nʼaka Nebukadneza bụ eze Babilọn. Ọ ga-etigbukwa ha nʼihu unu.
JER 29:22 Nʼihi ha, ndị niile e si Juda dọta nʼagha buru gaa Babilọn ga na-ekwu okwu nkọcha sị, ‘Ka Onyenwe anyị mesokwa gị ụdị mmeso o mesoro Zedekaya na Ehab, ndị eze Babilọn tụnyere nʼọkụ nke regburu ha.’
JER 29:23 Nʼihi na ha emeela ihe ndị jọgburu onwe ya na njọ nʼIzrel; ha na nwunye ndị agbataobi ha akwaala iko; ha esitekwala nʼaha m buo amụma ụgha, amụma nke m na-enyeghị ha iwu ibu. Amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu, nʼihi na ahụrụ m ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 29:24 Gwa Shemaya onye Nehelam okwu sị ya,
JER 29:25 Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “I dere akwụkwọ zigara ndị niile bi na Jerusalem, ha na Zefanaya nwa Maaseia onye nchụaja, na ndị nchụaja ndị ọzọ. Ị gwara Zefanaya okwu nʼakwụkwọ ahụ sị ya,
JER 29:26 ‘Onyenwe anyị ahọpụtala gị mee gị onye nchụaja ga-anọchi anya Jehoiada. Nʼihi ya, ị bụrụla onyeisi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya mere, o kwesiri ka i jide onye ara ọbụla na-akpọ onwe ya onye amụma, manye ya agbụ igwe nʼụkwụ, na nʼolu ya.
JER 29:27 Gịnị mere i ji hapụ ịbasiri Jeremaya, onye Anatot mba ike, onye na-eme onwe ya onye amụma nʼetiti unu?
JER 29:28 O ziterela anyị ozi dị otu a na Babilọn sị anyị, Unu ga-anọ nʼebe ahụ tee anya. Ya mere, wuoronụ onwe unu ụlọ, birikwanụ nʼime ya. Kụọnụ ihe nʼubi, riekwanụ ihe si nʼubi unu.’ ”
JER 29:29 Zefanaya bụ onye nchụaja, gụrụ akwụkwọ ozi ahụ nʼihu Jeremaya, bụ onye amụma.
JER 29:30 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jeremaya, sị,
JER 29:31 “Zigara ndị ahụ niile e mere ka ha gaa biri na mba ọzọ ozi sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shemaya onye Nehelam, Ebe ọ bụ na Shemaya ebuorola unu amụma mee ka unu tụkwasị obi unu nʼokwu ụgha ya, ma ọ bụghị m ziri ya,
JER 29:32 ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m aghaghị ịta Shemaya onye Nehelam na mkpụrụ ya ahụhụ nʼihi mmehie ya. Ọ gaghị enwe nwoke ọbụla ga-afọdụ ndụ nʼetiti ndị ya niile. Ọ gaghị esokwa unu lekwasị anya nʼihe ọma ahụ niile m na-akwado imere ndị m, nʼihi na o kwusara nnupu isi megide Onyenwe anyị. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
JER 30:1 Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya.
JER 30:2 “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Dee ihe niile m gwara gị nʼime akwụkwọ.
JER 30:3 Nʼihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-akpọghachite ndị m bụ Izrel na Juda si nʼebe e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọta. Aga m eme ka ha laghachi nʼala ahụ m nyere nna nna ha, ka ha nwetakwa ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.”
JER 30:4 Ma ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Izrel na Juda.
JER 30:5 “Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu, nke oke egwu, ọ bụghị udo.
JER 30:6 Jụọnụ ajụjụ, ma hụ, nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ? Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme, ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ?
JER 30:7 Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ. O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya. Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb, ma a ga-anapụta ya site na ya.
JER 30:8 “ ‘Nʼụbọchị ahụ,’ ‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu, tibisikwaa agbụ niile e kere ha. Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
JER 30:9 Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid eze ha, onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha.
JER 30:10 “ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Atụkwala ụjọ gị Izrel,’ Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya, zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ.
JER 30:11 Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi, bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha, agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri, ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’
JER 30:12 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara, “ ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta, mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala.
JER 30:13 O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị, o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa. Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị.
JER 30:14 Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị; ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha. E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe; ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ, nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu, mmehie gị dịkwa ọtụtụ.
JER 30:15 Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ? Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ? Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị, na nʼihi ọtụtụ mmehie gị.
JER 30:16 “ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị; ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ. Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike. Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha.
JER 30:17 Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike; aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. ‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ. Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’
JER 30:18 “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu ya; aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya. A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya; ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya.
JER 30:19 Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele, na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ. Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ, ha agaghị adịkwa ole na ole. Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ, ndị a na-agaghị eledakwa anya.
JER 30:20 Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ, nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m. Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ.
JER 30:21 Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha; onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta. Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso, nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam, maka ịbịaru m nso?’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 30:22 ‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’ ”
JER 30:23 Lee, Onyenwe anyị ga-esite nʼọnụma ya mee ka oke ifufe ya fee. Ọ ga-efekwasị ndị na-emebi iwu dịka ifufe na-efesi ike.
JER 30:24 Iwe ọkụ Onyenwe anyị agaghị akwụsị tutu ruo mgbe o mezuru ihe ndị o bu nʼobi. Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa unu ga-aghọta ihe ndị a.
JER 31:1 “Nʼoge ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya, sị, “Aga m abụ Chineke nke agbụrụ Izrel niile. Ha ga-abụkwa ndị m.”
JER 31:2 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ndị ahụ gbanarịrị mma agha ga-ahụta ihuọma nʼọzara. Aga m abịa iwetara Izrel izuike.”
JER 31:3 Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị, “Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya; Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso.
JER 31:4 Aga m ewulikwa gị elu ọzọ, e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke. Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu.
JER 31:5 Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige nʼelu ugwu Sameria. Ndị ọrụ ubi kụrụ ya ga-erikwa mkpụrụ si na ya.
JER 31:6 Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha, ‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn, ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ”
JER 31:7 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb, tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu. Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ, ‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị, bụ ndị Izrel fọdụrụ.’
JER 31:8 Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha; aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha. Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ, na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme. Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu!
JER 31:9 Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta, ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha. Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi, nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha, nʼihi na aghọọlara m Izrel nna, Ifrem bụkwa ọkpara m.
JER 31:10 “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile; kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile. Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha. Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.
JER 31:11 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb, ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike.
JER 31:12 Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ, ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha, dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi. Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile; ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ.
JER 31:13 Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ, ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ. Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ, aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute.
JER 31:14 Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta, afọ ezi ihe m ga-ejukwa ndị m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 31:15 Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “A nụrụ otu olu na Rema, iru ụjụ na oke ịkwa akwa. Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya, o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya, nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.”
JER 31:16 Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa, jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri, nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa.
JER 31:17 Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha.
JER 31:18 “Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị, ‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike. Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị. Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa, nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m.
JER 31:19 Mgbe m kpafuru, echegharịrị m. Mgbe m ghọtakwara, e tiri m aka nʼobi m, ihere mere m, ọ wutekwara m nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’
JER 31:20 Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke, onye ihe ya na-atọ m ụtọ? Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya, ma anọkwa m na-echeta ya. Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike. Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 31:21 “Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama, manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama. Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile, bụ okporoụzọ unu ga-eso. Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, laghachi nʼobodo gị ndị a.
JER 31:22 Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị, gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel? Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa; nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.”
JER 31:23 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’
JER 31:24 Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha.
JER 31:25 Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ.”
JER 31:26 Nʼoge a, esi m nʼụra teta, lee anya gburugburu m. Ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
JER 31:27 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda.
JER 31:28 Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 31:29 “Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa, “ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha, ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’
JER 31:30 Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji.
JER 31:31 “Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda.
JER 31:32 Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe ahụ m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 31:33 “Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m etinye iwu m nʼime obi ha, aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.
JER 31:34 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”
JER 31:35 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie, onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu ka ha na-enye ihe nʼanyasị, onye na-akpali oke osimiri, na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
JER 31:36 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa, ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị, ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.”
JER 31:37 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe, na ịdị omimi nke ntọala ụwa, ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel, nʼihi ihe niile ha mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 31:38 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ.
JER 31:39 Ịdị ogologo nke eriri ọtụtụ a ga-eji tụọ ya ga-adị ka site nʼihu ọnụ ụzọ ama ahụ ruo nʼugwu Gareb, gaakwa ruo Goa.
JER 31:40 Ndagwurugwu ahụ niile ebe a tụnyere ozu ndị mmadụ, na ebe e kpofuru ntụ, na mgbada ugwu ahụ niile ebe e doziri edozi maka ịkụ ihe, ruo na ndagwurugwu iyi Kidrọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama ịnyịnya, ga-aghọkwa ebe dị nsọ nye Onyenwe anyị. A gaghị ehopukwa obodo ahụ ọzọ, maọbụ tikpọọ ya.”
JER 32:1 Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị nke rutere Jeremaya nʼafọ nke iri nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nke bụkwa afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadneza.
JER 32:2 Nʼoge a, ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu. E tinyekwara Jeremaya, bụ onye amụma nʼogige ụlọ ndị nche nke dị nʼụlọeze Juda.
JER 32:3 Zedekaya eze Juda tụrụ ya mkpọrọ nʼebe ahụ, sị ya, “Gịnị mere i ji na-ebu amụma dị otu a. Nʼihi na ị na-asị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m inyefe gị na obodo a nʼaka eze Babilọn. Ọ ga-alụtakwa ya nʼagha.
JER 32:4 Zedekaya eze Juda agaghị agbapụ site nʼaka ndị Babilọn, nʼihi na a ga-enyefe ya nʼaka eze Babilọn, onye ya na ya ga-ekwurịtakwa okwu ihu na ihu. Zedekaya ga-ejikwa anya ya abụọ hụ eze Babilọn,
JER 32:5 onye ga-eduru ya, bụ Zedekaya, gaa Babilọn, ebe ọ ga-anọ tutu ruo mgbe mụ, bụ Onyenwe anyị, mesiri ya ike. Ọ bụrụ na ibuso ndị Babilọn agha, ị gaghị emeri.’ ”
JER 32:6 Jeremaya sịrị, “Okwu Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,
JER 32:7 Lee, Hanamel nwa Shalum, nwanne nna gị, ga-abịakwute gị, sị gị, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼihi na ebe ị bụ onye ikwu m ọ bụ gị ka o ruuru ịzụ ya.’
JER 32:8 “Mgbe ahụ, dịka Onyenwe anyị si kwuo ya, Hanamel nwa nwanne nna m bịakwutere m nʼogige ndị nche sị m, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼime ala ndị Benjamin. Ebe ọ bụ ihe ruuru gị ịgbapụta ya ime ka ọ bụrụ nke gị, ọ bụ gị kwesiri ịzụ ya.’ “Amaara m na nke a bụ okwu Onyenwe anyị.
JER 32:9 Ya mere, azụrụ m ala ahụ dị nʼAnatot site nʼaka nwanna m Hanamel. Atụpụtara m ọlaọcha shekel iri na asaa ọnụahịa ala ahụ, jiri ya kwụọ ya ụgwọ.
JER 32:10 Emesịa, etinyere m aka m nʼakwụkwọ ire ala ahụ, kaa ya akara, nyachie ya, nʼihu ndị akaebe. Atụkwara m ọlaọcha ahụ nʼihe ọtụtụ.
JER 32:11 Eweere m akwụkwọ ịzụta ala ahụ a kara akara, nke a nyachikwara anyachi, ebe e dere ihe banyere ọzụzụ na orire nke ala ahụ, werekwa ụdị akwụkwọ ahụ nke a na-anyachighị anyachi,
JER 32:12 nyefee ha nʼaka Baruk nwa Neraya, nwa Mahseia, nʼihu Hanamel nwanna m, na nʼihu ndị akaebe ndị ọzọ, ndị aka ha dị nʼakwụkwọ ahụ, na nʼihu ndị Juu ndị ọzọ, ndị nọ nʼogige ụlọ ndị agha ahụ.
JER 32:13 “Nʼihu ha, enyere m Baruk iwu ndị a sị ya,
JER 32:14 ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Were akwụkwọ ndị a, ma nke a nyachiri anyachi, ma nke a na-anyachighị anyachi, tinye ha nʼime ite e ji ụrọ kpụọ, ebe ha ga-adị ogologo oge.
JER 32:15 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, a ga-emesịakwa zụọ ụlọ, ala ubi nakwa ubi vaịnị nʼala a.’
JER 32:16 “Mgbe m nyechasịrị Baruk nwa Neraya akwụkwọ ndị ahụ, ekpere m ekpere nye Onyenwe anyị sị,
JER 32:17 “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ọ bụ gị sitere nʼike gị dị ukwuu, na aka gị e setịrị eseti mee eluigwe na ụwa. O nweghị ihe ọbụla ị na-enweghị ike ime.
JER 32:18 Ị na-egosi ịhụnanya nye ọtụtụ puku ndị mmadụ ma na-eweta ịta ahụhụ nye ụmụ site nʼihi mmehie nna ha. O Chineke dị ukwuu dịkwa ike, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha gị.
JER 32:19 Nzube gị dị ukwuu, otu a kwa akaọrụ gị dịkwa ukwuu. Anya gị ghere oghe nye ụzọ mmadụ niile. Ị na-akwụghachikwa onye ọbụla dịka ndụ ya na akaọrụ ya si dị.
JER 32:20 Ọ bụ gị mere ihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche nʼIjipt. Ị nọgidekwara na-arụ ha ruo taa, ma nʼala Izrel ma nʼetiti ndị niile nọ nʼụwa. Nʼihi ya, i meere onwe gị aha nke ka bụkwa nke gị nʼebe niile.
JER 32:21 Ọ bụ ihe ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche, nʼaka dị ike, na ogwe aka e setịpụrụ esetipụ, nʼihe oke egwu, ka i ji kpọpụta ndị gị Izrel site nʼIjipt.
JER 32:22 Ị nyere ha ala a, nke ị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
JER 32:23 Ha batara nʼala a, nweta ya, ma ha jụrụ irubere gị isi, maọbụ jegharịa nʼiwu gị; ha emeghị ihe ndị i nyere ha nʼiwu mee. Nʼihi ya, i mere ka ihe ọjọọ ndị a bịakwasị ha.
JER 32:24 “Lee ka ndị iro si wuo ihe agha ha gburugburu mgbidi obodo a, ihe agha nke ha ga-eji lụta ya nʼagha. I werela obodo a nyefee ndị Babilọn na-ebuso ya agha nʼaka, nʼihi mma agha na ụnwụ, na oke ọrịa dị nʼime ya. Ihe i kwuru na ọ ga-eme emezuola, dịka i si ahụ ya ugbu a.
JER 32:25 Ma ọ bụ ezie na a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn, ma gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gwara m sị, ‘Were ọlaọcha zụta ala ahụ. Zụkwaa ya nʼihu ndị akaebe.’ ”
JER 32:26 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
JER 32:27 “Abụ m Onyenwe anyị, Chineke nke anụ ahụ niile bụ mmadụ. Ọ dị ihe ọbụla karịrị m ime?
JER 32:28 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ejikerela m ugbu a inyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn, na nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, onye ga-alụta ya nʼagha.
JER 32:29 Ndị Babilọn ahụ na-ebuso obodo a agha, ga-abata nʼime ya, kpọọ ya ọkụ. Ha ga-akpọ ya ọkụ, ya na ụlọ niile dị nʼime ya, bụ ụlọ niile ahụ ndị bi nʼime ya nọ kpasuo m iwe, site nʼisure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi Baal nʼelu ụlọ ha niile, na site nʼịwụsara chi ndị ọzọ onyinye ihe ọṅụṅụ.
JER 32:30 “Ọ bụ naanị ihe ọjọọ ka ndị Izrel na ndị Juda mere nʼihu m site na mgbe ha bụ nwantakịrị. Nʼezie, ha esitela nʼihe ha ji aka mee kpasuo m iwe, ka Onyenwe anyị kwuru.
JER 32:31 Site nʼoge e wuru ya ruo ugbu a, ndị bi nʼobodo a akpaliela iwe m na ọnụma m. Ya mere, aga m esite nʼihu m wezuga ha.
JER 32:32 Ndị Izrel na Juda, na ndị eze ha, na ndịisi ọchịchị ha, na ndị nchụaja ha, na ndị amụma ha, na ndị ikom Juda, ma ndị bi na Jerusalem, akpasuola m iwe site nʼihe ọjọọ niile ha mere.
JER 32:33 Ha gbakụtara m azụ, jụ ilenye anya nʼebe m nọ. Ọ bụ ezie na m ziri ha ihe mgbe mgbe, ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ịnabata ịdọ aka na ntị m.
JER 32:34 Ha doro oyiyi ihe arụ nʼụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m, si otu a merụọ ya.
JER 32:35 Ha wuru ebe dị elu dị iche iche na Ndagwurugwu nke Ben Hinom nye Baal, ebe ha nọ jiri ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọ aja nye Molek. O nweghị mgbe m nyere ha iwu ime ihe dị otu a, o nweghị mgbe ajọ ihe dị otu a batara m nʼobi, nke i nye ha iwu ime ihe arụ dị otu a, nke ime ka Juda mehie.
JER 32:36 “Ihe i kwuru banyere obodo a bụ, ‘A ga-esite na mma agha, na nʼụnwụ, na nʼoke ọrịa, nyefee ha nʼaka eze Babilọn,’ ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru,
JER 32:37 Lee, aghaghị m ịchịkọta ha site na mba ndị ahụ niile m sitere nʼiwe m, na nʼoke ọnụma m chụga ha. Aga m akpọghachite ha nʼebe a, mee ka ha biri nʼudo.
JER 32:38 Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.
JER 32:39 Aga m enye ha otu obi na otu ụzọ, ime ka ha na-atụ egwu m, nʼihi ọdịmma nke ha, na ọdịmma nke ụmụ ha ndị ga-eso ha.
JER 32:40 Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ha. Agaghị m akwụsị imere ha ihe ọma, aga m akwalikwa obi ha ịtụ egwu m. Nʼụzọ dị otu a, ha agaghị esitekwa nʼiso m wezuga onwe ha.
JER 32:41 Obi ga-atọkwa m ụtọ ime ha mma; m ga-ejikwa obi m niile, na mkpụrụobi m niile kụọ ha nʼala a.
JER 32:42 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Dịka m mere ka ihe ọjọọ ukwuu a niile bịakwasị ndị a, otu a ka m ga-esikwa mee ka ezi ihe ahụ niile m kwere ha na nkwa bịakwasị ha.
JER 32:43 A ga-azụkwa ọhịa nʼala a unu na-asị na ọ bụ ala tọgbọrọ nʼefu, nke mmadụ na anụmanụ na-adịghị nʼime ya, ala nke e nyefere nʼaka ndị Babilọn.
JER 32:44 A ga-ejikwa ọlaọcha zụọ ala ubi, deekwa ihe banyere orire na ọzụzụ ya nʼakwụkwọ. A ga-aka akwụkwọ ndị ahụ akara nʼihu ndị akaebe, nʼala Benjamin, na nʼobodo nta niile dị gburugburu Jerusalem, ma nʼala Juda, na nʼobodo dị nʼala ugwu ugwu, na nke dị na mgbada ugwu niile dị nʼọdịda anyanwụ, na nke dị na Negev, nʼihi na aga m esite nʼobodo ndị ahụ dọtara ha nʼagha buuru ha gaa kpọlata ha. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.”
JER 33:1 Mgbe Jeremaya ka nọ dịka onye mkpọrọ nʼogige ụlọ ndị nche, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị nke ugboro abụọ, sị ya,
JER 33:2 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, onye ahụ kere ụwa kwuru, Onyenwe anyị, onye kpụrụ ya mee ya ka o guzosie ike, Onye aha ya bụ Onyenwe anyị:
JER 33:3 ‘Kpọkuo m, aga m aza gị, gosi gị ihe dị ukwuu dị iche iche, na ihe siri ike na nghọta nke ị na-amaghị.’
JER 33:4 Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, kwuru banyere ụlọ ndị ahụ niile dị nʼobodo, na ụlọeze niile nke ndị eze Juda, bụ nke akwadara maka iji megide nnọchibido niile na mma agha
JER 33:5 nʼagha a na-alụso ndị Babilọn. ‘Aga eji ozu ndị mmadụ ahụ niile m ga-etigbu site nʼiwe m na nʼọnụma m kpojuo ha. Aga m ezo ihu m site nʼebe obodo a nọ, nʼihi ajọ omume ya niile.
JER 33:6 “ ‘Ma otu ọ dị, aga m agwọ ya, mee ka ahụ sie ya ike. Aga m agwọ ndị m, meekwa ka ha nwe udo nʼebe ọ bara ụba. Ha ga-ebikwa nʼudo na-enweghị egwu ọbụla.
JER 33:7 Aga m emekwa ka ndị Izrel na ndị Juda a dọtara nʼagha lọta. Aga m ewugharịkwa ha dịka ụlọ, mee ka ha dịrị ka ha dị na mbụ.
JER 33:8 Aga m eme ka ha dị ọcha site na mmehie ha niile, nke ha mere megide m. Aga m agbaghara ha mmehie ha na nnupu isi ha niile megide m.
JER 33:9 Mgbe ahụ, obodo a ga-aghọkwa ihe ga-eme ka mba niile nke ụwa mara m, ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime m, tookwa m, ma wetara m nsọpụrụ, mgbe ha ga-anụ ihe ọma niile m meere obodo a. Ha ga-atụkwa oke egwu, maakwa jijiji, nʼihi ezi ihe ahụ niile na nʼihi udo ahụ niile nke mụ onwe m mere ka o rute ha aka.’
JER 33:10 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu na-asị banyere ebe a, “Ọ bụ mkpọmkpọ ebe, ebe ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya.” Ma nʼobodo Juda, ya na okporoụzọ niile dị na Jerusalem, nke tọgbọrọ nʼefu ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, a ga-emesịa nụkwa
JER 33:11 olu ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị ahụ niile na-eweta onyinye ekele nʼụlọ Onyenwe anyị, ndị ahụ ga-asị, “ ‘ “Nyenụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekele nʼihi na Onyenwe anyị dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼihi na aga m eme ka ndị ala a, nke a dọtara nʼagha lọta, dịkwa ka ha dị na mbụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
JER 33:12 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nʼebe a, nke bụ mkpọmkpọ ebe ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, ka a ga-emesịa nweekwa ebe ịta nri nke igwe ewu na atụrụ, nʼime obodo niile, ebe ndị ọzụzụ atụrụ ga-eduru igwe ewu na atụrụ ha gaa izuike.
JER 33:13 Nʼime obodo niile nke dị nʼala ugwu ugwu, na nʼobodo niile nke dị na mgbada ugwu niile nke Negev, nʼoke ala Benjamin, nʼime obodo nta niile nke gbara Jerusalem gburugburu, na nʼime obodo niile nke Juda. Igwe ewu na atụrụ ga-agabigakwa ọzọ nʼokpuru aka abụọ nke onye na-agụ ha ọnụ.’ Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu.
JER 33:14 “ ‘Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-emezu ezi nkwa ahụ m kwere ụlọ Izrel na ụlọ Juda.
JER 33:15 “ ‘Nʼụbọchị ndị ahụ, na nʼoge ahụ, aga m eme ka Alaka ezi omume pupụta site nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-eme ihe ziri ezi, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.
JER 33:16 Nʼụbọchị ndị ahụ, ka a ga-azọpụta Juda, Jerusalem ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya, Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ ezi omume anyị.’
JER 33:17 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘O nweghị oge a ga-ahapụ inweta otu onye site nʼezinaụlọ Devid onye ga-anọ nʼocheeze ụlọ Izrel.
JER 33:18 Ọ dịkwaghị mgbe a ga-ahapụ inweta onye ga-esite nʼetiti ndị nchụaja na ndị Livayị, nke ga-eguzo nʼihu m ụbọchị niile ịchụ aja nsure ọkụ, na i wetara m onyinye ịnata ihuọma, na ịchụrụ m aja dị iche iche.’ ”
JER 33:19 Emesịa, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
JER 33:20 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike ime ka ọgbụgba ndụ m na ehihie, na ọgbụgba ndụ mụ na abalị ghara ịdịkwa, ime ka ehihie na abalị gharakwa ịpụta nʼoge ha,
JER 33:21 mgbe ahụ ọgbụgba ndụ nke mụ na Devid ohu m gbara, na ọgbụgba ndụ nke m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na ndị Livayị, bụ ndị nchụaja na-eje ozi ha nʼihu m, agaghị adịkwa. A gaghị enwekwa onye ga-esi nʼezinaụlọ Devid nke ga-anọkwasị nʼocheeze ya.
JER 33:22 Aga m eme ka ụmụ ụmụ Devid ohu m, na ndị Livayị, bụ ndị na-eje ozi ha nʼihu m, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe; ha ga-adịkwa ukwuu dịka uzuzu dị nʼọnụ mmiri osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ”
JER 33:23 Okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
JER 33:24 “Ị hụla ajụjụ ndị a na-ajụ? Ha na-ajụ na-asị, ‘Onyenwe anyị ọ jụla agbụrụ abụọ ndị a ọ họpụtara?’ Nʼihi ya, ha na-elelị ndị m, ha adịghị agụkwa ha dịka mba.
JER 33:25 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na m emeghị ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti mụ na ehihie na abalị, meekwa ka iwu na-achị eluigwe na ụwa guzosie ike,
JER 33:26 mgbe ahụ, agaara m ajụ ụmụ ụmụ Jekọb, na ụmụ ụmụ Devid ohu m. Agaraghị m ahọpụta otu nʼime ụmụ ya ka ọ chịa ụmụ ụmụ Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ma aga m eme ka ndị ha a dọtara nʼagha lọta; aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ha.’ ”
JER 34:1 Mgbe Nebukadneza eze Babilọn na ndị agha ya niile, na mba niile dị nʼalaeze nke ọ na-achị na-ebuso Jerusalem na obodo niile gbara ya gburugburu agha, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị,
JER 34:2 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, Jekwuru Zedekaya bụ eze Juda, gwa ya sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m ugbu a inyefe eze Babilọn obodo a nʼaka. Ọ ga-esurekwa ya ọkụ.
JER 34:3 Ị gaghị agbanarị ya, nʼihi na ọ ga-ejide gị. A ga-arara gị nyefekwa ya nʼaka. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ eze Babilọn. Gị na ya ga-ekwurịtakwa okwu. Ị ga-agakwa Babilọn.
JER 34:4 “ ‘Ma nụrụkwa nkwa Onyenwe anyị na-ekwe gị, gị Zedekaya eze Juda. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere gị, Ị gaghị anwụ site na mma agha;
JER 34:5 ị ga-anwụ nʼudo. Dịka ndị mmadụ si mụnye ọkụ kwaa ozu nna gị ha, bụ ndị buru gị ụzọ chịa ka eze, otu a ka ha ga-esi mụnye ọkụ kwaa gị. Ha ga-eti aka nʼobi kwa akwa sị, “Ewoo, onyenwe anyị!” Ọ bụ mụ onwe m na-ekwe nkwa a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
JER 34:6 Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma gara gwa Zedekaya eze Juda ihe ndị a niile na Jerusalem.
JER 34:7 Nʼoge a, ndị agha eze Babilọn na-ebuso Jerusalem agha. Ha na-ebusokwa obodo ndị ọzọ nke nọgidere na-ebuso ha agha, nke bụ obodo Lakish na Azeka. Obodo ndị a bụ naanị obodo fọdụrụ nʼala Juda nke ndị agha Babilọn na-emeribeghị.
JER 34:8 Okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị mgbe Zedekaya bụ eze, na ndị Izrel niile gbachara ndụ na Jerusalem ịkpọsara ndị ohu niile nwere onwe ha.
JER 34:9 Onye ọbụla ga-ahapụ ohu ya bụ onye Hibru ka o nwere onwe ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị. A gaghị agụkwa onye Juu ọbụla dịka ohu ọzọ.
JER 34:10 Ya mere, ndịisi ọchịchị niile, na ndị niile bụ ndị kwekọrịtara gbaa ndụ a, na ha ga-ahapụ ohu ha ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha nwere onwe ha. Ha mekwara dịka ha si kwuo.
JER 34:11 Ma mgbe oge nta gasịrị, ndị a niile gbanwere obi ha. Ha gara jide ohu ndị ahụ ha hapụrụ, mee ka ha ghọọkwa ndị ohu ha ọzọ.
JER 34:12 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
JER 34:13 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, kwuru, Mụ na nna nna unu ha gbara ndụ mgbe m si nʼala Ijipt, bụ ala ebe ha bụ ohu kpọpụta ha. Mgbe ahụ agwara m ha sị,
JER 34:14 ‘Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhapụ onye Hibru ibe unu resiri unu onwe ya dịka ohu, ka o nwerekwa onwe ya. Mgbe onye ahụ jeere unu ozi afọ isii, unu kwesiri ịhapụ ya ka o nwere onwe ya.’ Ma nna nna unu ha egeghị m ntị, ha etinyeghịkwa uche ha nʼiwu m nyere ha.
JER 34:15 Na nwa oge nta gara aga unu chegharịrị mee ihe ziri ezi nʼanya m. Onye ọbụla nʼime unu kpọsara inwere onwe nye ndị unu. Unu gara nʼihu gbaa ndụ nʼihu m nʼime ụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m.
JER 34:16 Ma ugbu a, unu echigharịala, merụọ aha m; onye ọbụla nʼime unu akpọghachikwala nye onwe ya ndị ohu ndị ikom na ndị inyom ahụ unu hapụrụ ka ha nwere onwe ha, gaa dịka o si masị mkpụrụobi ha. Unu akwagidekwala ha ka ha bụrụkwa ndị ohu unu ọzọ.
JER 34:17 “Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu erubeghị isi nye m, unu ekwusaghị nwere onwe nye ndị unu. Ya mere, ugbu a mụ onwe m na-akpọsa ‘Inwere onwe’ nye unu, ka Onyenwe anyị kwubiri, ‘inwere onwe’ nke ịda nʼihi mma agha, na ajọ ọrịa na-efe efe, na oke ụnwụ. Aga m emekwa unu ka unu ghọọ ihe ịsọ oyi nye alaeze niile nke ụwa.
JER 34:18 Ma ndị ikom ahụ niile merụrụ ọgbụgba ndụ m, ndị ahụ na-edebezughị ọgbụgba ndụ ha gbara nʼihu m, ka m ga-eme ka ha dịrị ka nwa ehi ọgbụgba ndụ ahụ ha kpọwara abụọ, nke ha si nʼetiti ọkara abụọ ya gafee, maka imesi ọgbụgba ndụ ha ike.
JER 34:19 Ndị ndu Juda na Jerusalem na ndị ozi eze na ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a ndị si nʼetiti ọkara nwa ehi ahụ gabiga
JER 34:20 ka m ga-enyefe nʼaka ndị iro ha ndị na-achọ iwepụ ndụ ha. Ozu ha ga-abụ ihe oriri nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa.
JER 34:21 “Aga m enyefe Zedekaya eze Juda na ndịisi ọchịchị ya nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọ ndụ ha. Aga m enyefe ha nʼaka ndị agha eze Babilọn, ndị siterela nʼibuso unu agha wezuga onwe ha.
JER 34:22 Aga m enye iwu, ka Onyenwe anyị kwubiri, mee ka a kpọghachi ha azụ nʼobodo a. Ha ga-ebuso ya agha, merie ya, surekwaa ya ọkụ. Aga m emekwa ka obodo Juda niile tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya.”
JER 35:1 Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya ntị nʼoge ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda sị ya,
JER 35:2 “Jee nʼụlọ ụmụ Rekab kpọọ ha oku ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼotu nʼime ọnụụlọ ya, nọdụ nʼebe ahụ nye ha mmanya ka ha ṅụọ.”
JER 35:3 Ya mere, ejekwuuru m Jaazanaya nwa Jeremaya, nwa Habazinaya na ụmụnne ya, na ụmụ ya ndị ikom, ya bụ, ndị ezinaụlọ Rekab niile.
JER 35:4 Akpọbatara m ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼime ọnụụlọ ụmụ Hanan nwa Igdalaya, onye nke Chineke. Ọnụụlọ a dị nso nʼọnụụlọ ndịisi ụlọnsọ, nke dị nʼelu ọnụụlọ Maaseia nwa Shalum, onye nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ.
JER 35:5 Mgbe ahụ, e doziri m ọkwa ụfọdụ jupụtara na mmanya na iko ụfọdụ nʼihu ụmụ Rekab, sị ha, “Ngwanụ, ṅụanụ mmanya.”
JER 35:6 Ma ha zara sị, “Anyị adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab nyere anyị iwu sị anyị, ‘Unu aṅụkwala mmanya, unu na ụmụ ụmụ unu.
JER 35:7 Ọzọkwa, unu ewurula onwe unu ụlọ, unu akụla mkpụrụ ubi, maọbụ kụọ ubi vaịnị. Unu adọtarala onwe unu ihe ndị a niile, kama na-ebinụ nʼụlọ ikwuu. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka unu ga-esi bie ogologo ndụ nʼala ahụ unu bụ ndị ọbịa nʼime ya.’
JER 35:8 Anyị erubela isi nʼihe niile nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab gwara anyị. Anyị na ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom adịghị aṅụ mmanya,
JER 35:9 maọbụ wuo ụlọ, maọbụ nwee ubi vaịnị, ala ubi maọbụ mkpụrụ ọkụkụ.
JER 35:10 Ọ bụkwa nʼụlọ ikwuu ka anyị na-ebi dị ka nna nna anyị Jehonadab nyere anyị nʼiwu.
JER 35:11 Ma mgbe Nebukadneza eze Babilọn busoro ala anyị agha, anyị kpebiri sị, ‘Bịanụ ka anyị gbaba Jerusalem si otu a gbanarị ndị agha Babilọn, na ndị agha ndị Aram.’ Ọ bụ nke a mere anyị ji biri na Jerusalem.”
JER 35:12 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya
JER 35:13 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Gaa gwa ndị Juda na ndị bi na Jerusalem, ‘Ọ bụ na unu agaghị esite nʼịdọ aka na ntị mụta irubere okwu m isi?’ ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 35:14 ‘Jehonadab nwa Rekab nyere ụmụ ụmụ ya iwu sị ha aṅụla mmanya, ha na-edebe iwu ahụ. Ruo taa, ha adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na ha na-edebe iwu nna nna ha nyere ha. Ma mụ onwe m agwala unu okwu mgbe na mgbe, ma unu jụrụ irubere m isi.
JER 35:15 Mgbe mgbe ka m ziteere unu ụmụ ohu m bụ ndị amụma, ndị bịara gwa unu okwu sị, “Dozienụ ụzọ unu, sitekwanụ nʼajọ omume unu tụgharịa. Unu niile nʼotu nʼotu, unu agbasola chi ndị ọzọ ife ha. Ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-ebi nʼala a m nyere unu na nna nna unu ha.” Ma unu jụrụ ịṅa ntị, jụkwa ige m ntị.
JER 35:16 Ụmụ ụmụ Jehonadab, nwa Rekab, emeela ihe nna nna ha nyere ha nʼiwu, ma ndị a jụrụ irubere m isi.’
JER 35:17 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel kwuru: ‘Geenụ ntị! Lee, ana m aga ime ka ihe ọjọọ bịakwasị Juda na ndị niile bi na Jerusalem, dịka m kwuru na ọ ga-adị. Nʼihi na agwala m ha okwu, ma ha jụrụ ige m ntị. Akpọrọ m ha oku, ma ha jụrụ ịza.’ ”
JER 35:18 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị ezinaụlọ Rekab, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Unu erubeela isi mee ihe niile nna nna unu bụ Jehonadab nyere unu nʼiwu.’
JER 35:19 Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru sị, ‘O nweghị mgbe ọbụla nwoke ga-ejere m ozi ga-akọ nʼezinaụlọ Jehonadab nwa Rekab.’ ”
JER 36:1 Nʼafọ anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya bụ eze Juda, okwu Onyenwe anyị ndị a ruru Jeremaya ntị,
JER 36:2 “Were akwụkwọ detuo okwu ahụ niile m gwarala gị banyere Izrel, na Juda, na banyere ndị mba ọzọ dị iche iche, bụ okwu ndị ahụ m bidoro ịgwa gị site nʼoge ọchịchị Josaya ruo ugbu a.
JER 36:3 Ma eleghị anya mgbe ndị Juda nụrụ ka e kwupụtara ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ m zubere, nke na-aga ịbịakwasị ha, onye ọbụla nʼime ha nʼotu nʼotu ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Mgbe ahụ, aga m agbaghara ha ajọ omume ha na mmehie ha.”
JER 36:4 Ya mere, Jeremaya kpọrọ Baruk nwa Neraya ka ọ bịakwute ya. Mgbe Jeremaya nọ na-akpọpụta okwu ahụ niile Onyenwe anyị gwara ya, Baruk nọkwa na-edepụta ha nʼakwụkwọ.
JER 36:5 Emesịa, Jeremaya gwara Baruk okwu sị ya, “Ọnọdụ nke m nọ nʼime ya ugbu a agaghị ekwe ka m site nʼebe a pụọ jeruo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
JER 36:6 Nʼihi ya, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼụbọchị ibu ọnụ, nọdụ nʼebe ahụ gụpụtara ndị mmadụ okwu Onyenwe anyị ndị a ị dere nʼakwụkwọ dịka m kpọpụtara ha. Gụpụtara ya ndị Juda si obodo niile bịa nʼụlọnsọ ahụ.
JER 36:7 Ma eleghị anya, ha ga-arịọ Onyenwe anyị arịrịọ. Ma eleghị anya onye ọbụla nʼime ha ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa, ka iwe na ọnụma dị ukwuu nke Onyenwe anyị ga-ekpughe megide ndị a ghara ịbịakwasị ha.”
JER 36:8 Baruk nwa Neraya mere dịka Jeremaya onye amụma si gwa ya. Ọ gụpụtara okwu Onyenwe anyị, nke dị nʼakwụkwọ ahụ, nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
JER 36:9 Nʼọnwa itoolu nke afọ ise nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda, e doro oge dị iche nye maka ibu ọnụ nʼihu Onyenwe anyị. E kwusara ibu ọnụ a nye ndị niile nọ na Jerusalem, na ndị si nʼobodo Juda niile bịa na Jerusalem.
JER 36:10 Baruk nọ nʼọnụụlọ Gemaraya nwa Shefan, bụ ode akwụkwọ, gụpụtara ndị niile nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu Jeremaya, nke dị nʼakwụkwọ a dị nsọ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke ụlọnsọ ahụ.
JER 36:11 Mgbe Mikaya nwa Gemaraya nwa Shefan nụrụ okwu Onyenwe anyị nke e si nʼakwụkwọ ahụ gụpụta,
JER 36:12 o si nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ ode akwụkwọ dị nʼụlọeze, ebe ndịisi niile zukọrọ. Ndị a bụ ndị zukọrọ nʼebe ahụ; Elishama, ode akwụkwọ, na Delaya nwa Shemaya, na Elnatan nwa Akboa, na Gemaraya nwa Shefan, na Zedekaya nwa Hananaya, na ndịisi ọchịchị ndị ọzọ.
JER 36:13 Mgbe Mikaya gwara ha ihe ọ nụrụ Baruk si nʼakwụkwọ ahụ gụpụtara ndị mmadụ,
JER 36:14 ndịisi ahụ niile zipụrụ Jehudi nwa Netanaya, nwa Shelemaya, nwa Kushi, ka o jekwuru Baruk sị ya “Were akwụkwọ ahụ ị si na ya gụpụtara ndị mmadụ ihe, bịa.” Ya mere, Baruk, nwa Neraya, ji akwụkwọ a nʼaka ya jekwuru ha.
JER 36:15 Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ha gwara ya sị ya, “Biko, nọdụ ala gụọra anyị ihe dị nʼakwụkwọ a.” Ya mere, Baruk gụpụtara ha ihe dị nʼakwụkwọ ahụ.
JER 36:16 Mgbe ha nụchasịrị okwu dị nʼakwụkwọ ahụ, ha lerịtara onwe ha anya nʼegwu, gwa Baruk okwu sị ya, “Anyị aghaghị ime ka okwu ndị a ruo eze ntị.”
JER 36:17 Ha jụrụ Baruk sị ya, “Gwa anyị i si aṅaa detuo ihe ndị a niile? Ọ bụ Jeremaya kpọpụtaara gị ihe i dere?”
JER 36:18 Baruk zara sị ha, “E, ọ bụ ya kpọpụtara m okwu ndị a niile m deturu. E ji m inki dee ha nʼakwụkwọ.”
JER 36:19 Mgbe ahụ, ndịisi ahụ gwara Baruk okwu sị ya, “Ọsọ, gaa ka gị na Jeremaya zoo onwe unu. Unu ekwekwala ka onye ọbụla mata ebe unu zoro onwe unu.”
JER 36:20 Mgbe ha zochasịrị akwụkwọ ahụ nʼọnụụlọ Elishama onye ode akwụkwọ, ha jekwuuru eze nʼogige ụlọ ya kọọrọ ya ihe niile.
JER 36:21 Eze ziri Jehudi ka ọ gaa weta akwụkwọ ahụ. Mgbe Jehudi wetara ya site nʼọnụụlọ Elishama, ode akwụkwọ, ọ gụrụ ya nʼihu eze, na nʼihu ndịisi ọchịchị ahụ niile guzo nʼakụkụ eze.
JER 36:22 Nʼọnwa nke itoolu ahụ, mgbe eze nọ nʼụlọ oyi ya, ọkụ na-enwukwa nʼime ite ọkụ dị nʼihu ya.
JER 36:23 Mgbe ọbụla Jehudi gụsịrị ibe akwụkwọ atọ maọbụ anọ, eze na-anara ya akwụkwọ ndị ahụ were agụba ode akwụkwọ chakasịa ha, wụnye ha nʼọkụ. O megidere otu a tutu ruo mgbe ọ wụnyechara akwụkwọ ndị ahụ niile nʼọkụ.
JER 36:24 Eze na ndị so ya nọdụ nʼoge a na-agụpụta akwụkwọ a atụghị egwu ọbụla; ha adọwakwaghị uwe ha igosi obi ọjọọ.
JER 36:25 Ọ bụ ezie na Elnatan na Delaya na Gemaraya rịọrọ eze sị ya adọkasịla akwụkwọ ndị ahụ, ma o geghị ha ntị.
JER 36:26 Kama eze nyere Jerameel otu nʼime ụmụ eze, na Seraya nwa Azriel, na Shelemaya nwa Abdeel iwu ijide Baruk ode akwụkwọ, na Jeremaya onye amụma, ma Onyenwe anyị zoro ha.
JER 36:27 Mgbe eze suresịrị akwụkwọ ahụ na okwu niile nke Baruk dere nʼime ya ọkụ, bụ okwu nke Jeremaya kpọpụtara site nʼọnụ ya, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya:
JER 36:28 “Werekwa akwụkwọ ọzọ dee okwu ndị ahụ niile e dere nʼakwụkwọ nke mbụ ahụ, nke Jehoiakim eze Juda kpọrọ ọkụ.
JER 36:29 Ọzọkwa, gwa Jehoiakim eze Juda sị ya, ‘otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ị kpọrọ akwụkwọ ndị ahụ ọkụ, kwuo sị, “Gịnị mere i ji dee nʼime ya na eze Babilọn aghaghị ịbịa bibie ala a, gbuchapụ ndị niile nọ nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ?”
JER 36:30 Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim eze Juda; Ọ gaghị amụta onye ga-anọ nʼocheeze Devid. Ọzọ, a ga-atụfu ozu ya nʼebe igirigi nke abalị ga-adakwasị ya, ebe okpomọkụ nke ehihie ga-erute ya.
JER 36:31 Aga m ata ya na ụmụ ya, na ndị ozi ya ahụhụ nʼihi ajọ omume ha. Aga m eme ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru ihe banyere ya bịakwasị ha na ndị niile bi na Jerusalem, na ndị Juda niile, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị.’ ”
JER 36:32 Ya mere, Jeremaya weere akwụkwọ ọzọ nye Baruk ode akwụkwọ, bụ nwa Neraya, dịka Jeremaya na-akpọpụta okwu, Baruk depụtakwara nʼakwụkwọ okwu ndị ahụ niile, nke Jehoiakim eze Juda surere nʼọkụ. A tụkwasịkwara nʼelu ha ọtụtụ okwu ndị ọzọ nke dịka ha.
JER 37:1 Emesịa, Nebukadneza eze Babilọn mere Zedekaya nwa Josaya eze Juda, nʼọnọdụ Konaya nwa Jehoiakim.
JER 37:2 Ma Zedekaya na ndị ozi ya, na ndị Juda niile egeghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị nke o si nʼọnụ Jeremaya onye amụma gwa ha.
JER 37:3 Zedekaya bụ eze, ziri Jehukal nwa Shelemaya, na Zefanaya onye nchụaja, bụ nwa Maaseia ozi sị ha, jekwuru Jeremaya onye amụma gwa ya okwu sị, “Biko, kpeere anyị ekpere, rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ.”
JER 37:4 Nʼoge a, Jeremaya nweere onwe ya ijegharị nʼetiti ndị Izrel, nʼihi na ha etinyebeghị ya nʼụlọ mkpọrọ.
JER 37:5 Nʼihi na mgbe ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu na-ebuso ya agha, ndị agha Fero sitere Ijipt na-apụkwute ha ibuso ha agha. Mgbe ndị agha Babilọn nụrụ na ndị agha Ijipt na-abịa, ha mere ngwangwa si nʼibuso Jerusalem agha wezuga onwe ha.
JER 37:6 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya onye amụma ntị sị ya,
JER 37:7 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel kwuru, Ihe ndị a ka ị ga-agwa eze Juda onye zitere ozi sị gị rịọọ m arịrịọ, ‘Ndị agha Fero ahụ si nʼIjipt pụta bịa inyere unu aka ga-emesịa laghachi nʼala ha bụ Ijipt.
JER 37:8 Mgbe ahụ, ndị agha Babilọn ga-alọghachikwa ibuso obodo a agha. Ha ga-emeri ya, dọta ya nʼagha, kpọọkwa ya ọkụ.’
JER 37:9 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu arafula onwe unu site nʼiche echiche sị, ‘Ndị Babilọn agaghị abịakwa ibuso anyị agha.’ E, ha agaghị abịakwa ọzọ.
JER 37:10 A sịkwa na ndị agha unu enwee ike merie ndị agha Babilọn ahụ ga-abịa ibuso unu agha, a sịkwa na ọ bụ naanị ndị e merụrụ ahụ bụ ndị fọdụrụ nʼetiti ha, ndị a ga-esi nʼogige ndị agha Babilọn pụta bịa kpọọ obodo a ọkụ.”
JER 37:11 Mgbe ndị agha Babilọn si na gburugburu Jerusalem wezuga onwe ha nʼihi ọbịbịa ndị agha Fero na-abịa,
JER 37:12 Jeremaya sitekwara na Jerusalem pụọ malite ịgawa nʼala ndị Benjamin, nʼihi iketa oke ruuru ya site nʼaka ndị bi nʼebe ahụ.
JER 37:13 Ma mgbe o ruru nʼọnụ ụzọ ama Benjamin, onyeisi ndị agha aha ya bụ Irija nwa Shelemaya, nwa Hananaya jidere ya, boo ya ebubo sị ya, “Ọ bụ ọsọ ka ị na-agba! Ị na-achọ ịgbakwuru ndị Babilọn!”
JER 37:14 Ma Jeremaya zara sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka ị na-ekwu. Anaghị m agba ọsọ ịgbakwuru ndị Babilọn.” Ma Irija egeghị ya ntị, kama o jidere Jeremaya kpụta ya nʼihu ndịisi ọchịchị.
JER 37:15 Ha were iwe megide Jeremaya, nye iwu ka e tie ya ihe, kpọchiekwa ya nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ. Nʼihi na ha ji ụlọ ahụ mere ụlọ mkpọrọ nʼoge a.
JER 37:16 E tinyere Jeremaya nʼime ụlọ mkpọrọ olulu, ebe ọ nọrọ ogologo oge.
JER 37:17 Emesịa, Zedekaya bụ eze nyere iwu ka a kpọta ya nʼụlọeze. Mgbe a kpọtara ya, Zedekaya jụrụ ya ajụjụ na nzuzo sị ya, “I nwere okwu site nʼaka Onyenwe anyị?” Jeremaya zara sị ya, “E, lee, a ga-arara gị nyefee gị nʼaka eze Babilọn.”
JER 37:18 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara Zedekaya, bụ eze okwu ọzọ sị ya, “Ihe ọjọọ dị aṅaa ka m mere megide gị, maọbụ megide ndị ọrụ gị, maọbụ megide ndị a, unu ji tinye m nʼụlọ mkpọrọ?
JER 37:19 Ebee ka ndị amụma unu nọ, bụ ndị ahụ na-eburu unu amụma na-asị unu, ‘Eze Babilọn agaghị ebuso unu agha, ọ gaghị ebusokwa ala a agha?’
JER 37:20 Ugbu a, biko, onyenwe m eze, biko gee m ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m: Ezighachila m nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ, nʼihi na ọ bụrụ na i mee otu a, aga m anwụ nʼebe ahụ.”
JER 37:21 Zedekaya bụ eze, nyere iwu ka e debe Jeremaya nʼogige ndị nche. O nyekwara iwu ka a na-enye ya achịcha e si nʼụlọ ndị na-eme achịcha na-ewebata ụbọchị niile, tutu ruo mgbe achịcha e nwere nʼobodo ahụ gwụsịrị. Ya mere, o mere ka Jeremaya nọgide nʼogige ndị nche.
JER 38:1 Shefataya nwa Matan, na Gedaliya nwa Pashua, na Jehukal nwa Shelemaya, na Pashua, nwa Malkija, nụrụ mgbe Jeremaya nọ na-agwa ndị mmadụ okwu ndị a sị ha,
JER 38:2 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Onye ọbụla nọgidere nʼime obodo a ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ, maọbụ site nʼọrịa na-efe efe. Ma onye ọbụla pụkwuru ndị Babilọn ga-adị ndụ. Ọ ga-adị ndụ, nʼihi na ọ ga-echebe ndụ ya.’
JER 38:3 Ihe ndị a kwa ka Onyenwe anyị kwuru, ‘A ga-arara obodo a nyefee ya nʼaka ndị agha eze Babilọn, onye ga-adọta ya nʼagha.’ ”
JER 38:4 Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị sịrị eze, “O kwesiri ka e gbuo nwoke a, nʼihi na ọ na-eme ka obi ndị agha na obi ndị mmadụ fọdụrụ nʼime obodo a na-ada mba site nʼụdị okwu ọ na-agwa ha. Ọ bụghị ọdịmma ndị a ka ọ na-eche echiche ya, kama ọ bụ otu ha ga-esi laa nʼiyi.”
JER 38:5 Zedekaya bụ eze zara sị ha, “Ọ dị unu nʼaka. Unu maara na o nweghị ihe ọbụla eze nwere ike ime igbochi unu ime ihe unu chọrọ.”
JER 38:6 Ya mere, ha jidere Jeremaya, tinye ya nʼime olulu mmiri Malkija, nwa eze. Olulu mmiri a dị nʼogige ụlọ ndị nche. Ọ bụ ụdọ ka ha ji wetuo Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ. Ma mmiri adịghị nʼime ya, naanị apịtị. Ya mere, Jeremaya danyere nʼime apịtị ahụ, mibanye nʼime ya.
JER 38:7 Ma Ebed-Melek, onye Kush, otu nʼime ndịisi ozi nʼụlọeze nụrụ na etinyela Jeremaya nʼime olulu mmiri. Mgbe eze nọdụrụ nʼọnụ ụzọ ama Benjamin,
JER 38:8 Ebed-Melek si nʼụlọeze pụọ jekwuuru ya nʼebe ahụ sị ya,
JER 38:9 “Onyenwe m eze, lee na mmeso ndị a mesoro Jeremaya onye amụma jọgburu onwe ya. Ha atụbala ya nʼime olulu mmiri hapụ ya ka ọ nọdụ nʼebe ahụ nwụọ nʼihi agụụ mgbe achịcha kọrọ nʼobodo.”
JER 38:10 Mgbe ahụ, eze nyere Ebed-Melek onye Kush iwu sị ya, “Sị nʼebe a kpọrọ iri mmadụ atọ ka gị na ha soro gaa dọpụta Jeremaya onye amụma site nʼolulu ahụ tupu ọ nwụọ.”
JER 38:11 Ya mere, Ebed-Melek duuru ndị ahụ pụọ. O buru ụzọ jee nʼọnụụlọ dị nʼokpuru ụlọakụ nke ụlọeze. Nʼebe ahụ, ọ chịpụtara ụfọdụ nkịrịnka akwa, na ụfọdụ uwe kara nka. O kenyere ha nʼụdọ, wetuore ya Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ.
JER 38:12 Ebed-Melek onye Kush ahụ gwara Jeremaya okwu sị ya, “Were nkịrịnka akwa ndị a, na uwe ndị a kara aka fanye ha na mkpa abụ gị, ime ka ụdọ a ghara imerụ gị ahụ.” Jeremaya mere dị ka a gwara ya.
JER 38:13 Emesịa, ha dọlịtere ya elu, dọpụta ya site nʼolulu mmiri ahụ. Site nʼoge ahụ, Jeremaya nọgidere nʼogige ụlọ ndị nche.
JER 38:14 Mgbe ahụ, Zedekaya bụ eze, ziri ozi ka a kpọta Jeremaya onye amụma, ka ọ bịakwute ya nʼọnụ ụzọ nke atọ, nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Mgbe ọ bịara, eze gwara ya okwu sị ya, “Achọrọ m ịjụ gị ajụjụ. Ezonarịla m ihe ọbụla.”
JER 38:15 Ma Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ọ bụrụ na m enye gị ọsịsa, ị gaghị egbu m? A sịkwa na m adụọ gị ọdụ, ị gaghị ege m ntị.”
JER 38:16 Ma Zedekaya bụ eze ṅụrụ iyi na nzuzo nye Jeremaya sị ya, “Dịka Onyenwe anyị onye nyere anyị ume anyị na-eku si adị ndụ, agaghị m egbu gị, maọbụ nyefee gị nʼaka ndị na-achọsi ndụ gị ike.”
JER 38:17 Mgbe ahụ, Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na ị pụkwuru ndịisi eze Babilọn nyefee onwe gị nʼaka ha, ha ga-echebe gị ndụ, ha agakwaghị akpọ obodo a ọkụ. Gị na ezinaụlọ gị ga-adịkwa ndụ.
JER 38:18 Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nyefee nʼaka ndịisi eze Babilọn, a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn. Ha ga-akpọkwa ya ọkụ, ma gị onwe gị agakwaghị agbapụ site nʼaka ha.’ ”
JER 38:19 Eze Zedekaya sịrị Jeremaya, “Mụ onwe m na-atụ egwu ndị Juu ahụ bụ ndị gbakwuru ndị Babilọn, nʼihi na ndị Babilọn nwere ike nyefee m nʼaka ha, ha ga-emesikwa m ike.”
JER 38:20 “Ha agaghị enyefe gị nʼaka ha,” ka Jeremaya zara ya. “Rubere Onyenwe anyị isi, site nʼime ihe m gwara gị. Mgbe ahụ, ihe niile ga-agara gị nke ọma. A ga-echebekwa ndụ gị.
JER 38:21 Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nye, lee ihe Onyenwe anyị mere ka m hụ:
JER 38:22 A ga-akpụta ndị inyom niile fọdụrụ nʼụlọeze Juda mee ka ha pukwuru ndịisi eze Babilọn. Ndị inyom ndị a ga-asị gị, “ ‘Ndị enyi gị ahụ niile ị na-atụkwasị obi arafuola gị, mee ka ị bụrụ onye e meriri emeri. Ụkwụ gị abụọ emikpuola nʼime apịtị, ugbu a, ndị enyi gị niile ahụ agbanarịla gị.’
JER 38:23 “A ga-akpụpụtara ndị Babilọn ndị nwunye gị niile na ụmụ gị niile. Gị onwe gị agaghị agbanarị ha, ma eze Babilọn ga-ejidekwa gị, a ga-esurekwa obodo a ọkụ.”
JER 38:24 Mgbe ahụ, Zedekaya gwara Jeremaya, “Ekwela ka ntị ọzọ nụ ihe ndị a niile mụ na gị kwuru, ma ọ bụghị ya, ị ga-anwụ.
JER 38:25 Ọ bụrụ na ndịisi ọchịchị anụ na mụ na gị kparịtara ụka, ha bịakwute gị, sị gị, ‘Gwa anyị ihe ị gwara eze na ihe eze gwara gị, ezola ihe ọbụla nʼebe anyị nọ, ma ọ bụghị ya anyị ga-egbu gị,’
JER 38:26 mgbe ahụ ị ga-agwa ha, ‘Anọ m na-arịọ eze arịrịọ ka ọ hapụ izighachi m nʼụlọ Jonatan, ka m nwụọ nʼebe ahụ.’ ”
JER 38:27 Ndịisi ọchịchị ahụ niile bịakwutere Jeremaya jụọ ya ajụjụ. Ọ gwakwara ha ihe ahụ niile eze nyere ya nʼiwu. Ha hapụrụ ịjụ ya ihe ọzọ, nʼihi o nwekwaghị onye ọzọ nụrụ okwu niile ya na eze kwuru.
JER 38:28 Jeremaya nọgidekwara nʼogige ndị nche tutu ruo ụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha. Otu a ka esi were Jerusalem.
JER 39:1 Otu a ka e si dọta Jerusalem nʼagha. Nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nʼọnwa nke iri ya, Nebukadneza eze Babilọn duuru ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha, Ha gbara ya gburugburu, nọchibido ya.
JER 39:2 Nʼụbọchị nke itoolu, nʼọnwa nke anọ, nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị Zedekaya, ha gwupuru mgbidi obodo ahụ.
JER 39:3 Mgbe ahụ, ndịisi niile nke eze Babilọn batara were ọnọdụ ha nʼọnụ ụzọ ama nke Etiti. Ndị a bụ ndị batara: Negal-Shareza onye Samga, na Nebo-Sasekim, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza onyeisi nke ọkwa ya dị elu, na ndịisi niile ọzọ nke eze Babilọn ndị fọdụrụ.
JER 39:4 Mgbe Zedekaya eze Juda na ndị agha ya niile hụrụ ha, ha gbapụrụ ọsọ. Ha ji abalị gbapụ nʼobodo ahụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, chee ihu nʼụzọ Araba.
JER 39:5 Ma ndị agha ndị Babilọn chụsoro ha nʼazụ, chụkwute Zedekaya na mbara ala Jeriko. Ha jidere ya, kpụgara ya Nebukadneza eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe ọ nọ maa ya ikpe.
JER 39:6 Ọ bụ na Ribla, ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile nʼihu ya. Ebe ahụ ka a nọkwa gbuo ndị Juda niile a na-asọpụrụ.
JER 39:7 Emesịa, ọ ghụpụrụ Zedekaya anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ kpọrọ ya gaa Babilọn.
JER 39:8 Ndị Babilọn sunyere ụlọeze na ụlọ ndị mmadụ niile ọkụ, kwatukwa mgbidi niile nke Jerusalem.
JER 39:9 Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, buuru ndị niile fọdụrụ nʼobodo, ha na ndị ahụ buuru ụzọ jekwuru ya, na ndị ọzọ fọdụrụ, bulaa ha Babilọn, dịka ndị a dọtara nʼagha.
JER 39:10 Ma Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, hapụrụ ụfọdụ ndị ogbenye, ndị na-enweghị ihe ọbụla nʼala Juda. Nʼoge ahụ, o nyere ha ubi vaịnị a gbara ogige na ala ubi niile.
JER 39:11 Ugbu a, Nebukadneza eze Babilọn enyelarị Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze iwu banyere Jeremaya, sị,
JER 39:12 “Kpọrọ ya, lekọtazie ya anya nke ọma; emekwala ya ihe ọjọọ ọbụla, kama meere ya ihe ọbụla ọ rịọrọ gị.”
JER 39:13 Ya mere, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, na Nebushazban, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza, bụ onyeisi ọkwa ya dị elu, na ndịisi ndị ọzọ niile nke eze Babilọn,
JER 39:14 ziri ndị jere kpọpụta Jeremaya site nʼogige ndị nche. Ha nyefere ya nʼaka Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ka o dulaa ya nʼụlọ ya. Ya mere, Jeremaya nọgidere nʼetiti ndị nke ya.
JER 39:15 Ma nʼoge ahụ, Jeremaya nọ dị ka onye mkpọrọ nʼogige ụlọ ndị nche, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị sị ya,
JER 39:16 “Jekwuru Ebed-Melek onye Kush, gwa ya sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Lee, ana m aga ime ka okwu ahụ m kwuru megide obodo a mezuo. Ihe ga-abịakwasị obodo a bụ ịla nʼiyi, ọ bụghị ọganihu. Nʼoge ahụ, ihe ndị a ga-emezukwa nʼihu gị.
JER 39:17 Ma aga m anapụta gị nʼụbọchị ahụ, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A gaghị enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị na-atụ egwu ha.
JER 39:18 Aga m azọpụta gị. Ị gakwaghị ada site na mma agha kama ị ga-agbapụkwa na ndụ, nʼihi na ị tụkwasịrị m obi.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
JER 40:1 Mgbe oge nta gasịrị site nʼoge Nebuzaradan ọchịagha ndị nche nọ na Rema mere ka Jeremaya nwere onwe ya, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị. Nebuzaradan hụrụ Jeremaya mgbe e kekọtara ya na ndị e si na Jerusalem na Juda dọta nʼagha agbụ, bụ ndị ahụ a na-ebula Babilọn.
JER 40:2 Mgbe ọchịagha ndị nche eze a hụrụ Jeremaya, ọ sịrị ya, “Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke gị nyere iwu na ihe ọjọọ ndị a ga-abịakwasị ala a.
JER 40:3 Ugbu a kwa Onyenwe anyị emeela ka ihe o kwuru mezuo. O wetarala ala a mbibi ahụ. Ma ihe ndị a niile mezuru nʼihi na ndị gị mehiere megide Onyenwe anyị, jụ irubere ya isi.
JER 40:4 Ma taata, ana m eme ka i nwere onwe gị site nʼagbụ nke e kere gị na nkwoji aka. Ọ bụrụ na ị chọọ, soro m gaa Babilọn. Nʼebe ahụ, aga m elezi gị anya nke ọma. Ọ bụrụkwa na i kpebie na ị gaghị eso m gaa Babilọn, abịala. Ma, lee, ala a niile dị gị nʼihu. Jee ka i biri nʼakụkụ ya ọbụla dị gị mma; jegharịakwa nʼebe ọbụla ị chọrọ.”
JER 40:5 Ma tupu Jeremaya atụgharịa ịhapụ ya pụọ, Nebuzaradan gwakwara ya ọzọ sị, “Laghachikwuru Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ na-elekọta obodo Juda niile. Gaa soro ya biri nʼetiti ndị gị, maọbụ i nwere ike gaa ebe ọbụla ọzọ dị gị mma.” Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ nyere ya ihe oriri hiri nne. O nyekwara ya onyinye, hapụ ya ka ọ laa.
JER 40:6 Ya mere, Jeremaya jekwuuru Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa, soro ya na ndị fọdụrụ nʼala ahụ biri.
JER 40:7 Mgbe ndịisi agha ahụ niile na ndị ikom ha, bụ ndị gbalagara nʼọhịa, nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya nwa Ahikam, onye na-achị ala ahụ, na onye nlekọta ndị ikom na ndị inyom, na ụmụntakịrị, bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị a na-eburughị gaa Babilọn, ka ha gaa biri nʼala ọzọ,
JER 40:8 ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ ndị a; Ishmel nwa Netanaya, Johanan na Jonatan ụmụ Kariya, na Seraya nwa Tanhumet, na ụmụ Efai onye Netofa, na Jaazanaya nwa Maaka, na ndị ikom ha.
JER 40:9 Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha iyi, sị, “Unu atụla egwu ife ndị Babilọn: birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma.
JER 40:10 Mụ onwe m ga-ebi na Mizpa ịnọchite anya unu nʼihu ndị Babilọn ga-abịakwute anyị, ma gaanụ chịkọtaa mkpụrụ vaịnị niile, na mkpụrụ niile e kwesiri ịghọkọta nʼoge okpomọkụ, na mmanụ niile. Chikọtanụ ha tinye ha nʼime ite ichebe nri unu. Birikwanụ nʼobodo ahụ niile unu nwetara.”
JER 40:11 Mgbe ndị Juu niile nọ na Moab, na Amọn, na Edọm, na nʼobodo ndị ọzọ niile nụrụ na eze Babilọn hapụrụ ụfọdụ ka ha biri na Juda, na ọ họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, mee ya onye na-achị ndị ahụ niile,
JER 40:12 ha niile si nʼebe ahụ ha nọ lọghachikwa nʼala Juda. Ha lọkwutere Gedaliya na Mizpa, site na mba ndị ahụ niile a chụgara ha. Ha chịkọtakwara mmanya vaịnị, na mkpụrụ dị ukwuu, bụ mkpụrụ nke na-acha nʼoge okpomọkụ.
JER 40:13 Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha niile nọ nʼọhịa bịakwutere Gedaliya na Mizpa
JER 40:14 sị ya, “Ọ bụ na i maghị na Baalis eze ndị Amọn ezitela Ishmel nwa Netanaya ka ọ bịa gbuo gị?” Ma Gedaliya nwa Ahikam ekwetaghị na ọ bụ eziokwu ka ha na-ekwu.
JER 40:15 Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya pụrụ na nzuzo jekwuru Gedaliya na Mizpa sị ya, “Biko, kwere ka m gaa gbuo Ishmel nwa Netanaya. O nweghị onye ga-amata otu o si nwụọ. Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji gbuo gị, ime ka ndị Juu niile na-alọghachikwute gị gbasasịakwa ọzọ, na imekwa ka ndị Juda fọdụrụ laa nʼiyi?”
JER 40:16 Ma Gedaliya nwa Ahikam zara Johanan nwa Kariya sị ya, “Biko, emela ihe dị otu ahụ! Nʼihi na ihe ị na-ekwu banyere Ishmel abụghị eziokwu.”
JER 41:1 Nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye si nʼagbụrụ eze, na onye naara abụ otu nʼime ndịisi ozi eze, duuru ndị ikom iri bịa nʼụlọ Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa. Mgbe Gedaliya soo ha niile na-eri nri,
JER 41:2 Ishmel nwa Netanaya na mmadụ iri ndị ahụ ya na ha so, biliri jiri mma agha tigbuo Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, bụ onye eze Babilọn họpụtara dịka onye na-achị ala ahụ niile.
JER 41:3 Ishmel gbukwara ndị ikom Juda niile ha na Gedaliya nọ na Mizpa, gbukwaa ndị agha Babilọn nọkwa nʼebe ahụ.
JER 41:4 Nʼụbọchị na-eso ụbọchị ahụ ha gbusịrị Gedaliya, tupu mmadụ ọbụla anụ ihe banyere ya,
JER 41:5 o nwere iri mmadụ asatọ, bụ ndị kpụchara afụọnụ ha, dọwasịa uwe ha, gbukasịakwa onwe ha ahụ, sitere nʼobodo Shekem, na Shaịlo na Sameria buuru onyinye ịnata ihuọma, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-abịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
JER 41:6 Ishmel nwa Netanaya sitere na Mizpa pụọ izute ha, na-akwa akwa mgbe ọ na-aga. Mgbe o zutere ha, ọ sịrị ha, “Bịakwutenụ Gedaliya nwa Ahikam.”
JER 41:7 Mgbe ha batara nʼobodo, Ishmel nwa Netanaya na ndị ikom ahụ bụ ndị so ya, gburu ndị ahụ tụnye ozu ha nʼime olulu.
JER 41:8 Ma mmadụ iri nʼime ndị ahụ gwara Ishmel okwu sị ya, “Biko, egbula anyị, nʼihi na anyị nwere ọka wiiti na ọka balị, na mmanụ aṅụ anyị zoro nʼime ọhịa.” Nʼihi ya, o gbughị ha, kama ọ hapụrụ ha ndụ.
JER 41:9 Olulu ahụ Ishmel tụnyere ozu Gedaliya na ozu ndị ọzọ ahụ niile bụ olulu nke Asa bụ eze gwuru maka ichebe Jerusalem mgbe Baasha eze Izrel na-ebuso ya agha. Ọ bụkwa ozu ndị mmadụ ka Ishmel, nwa Netanaya kpojuru nʼime olulu ahụ.
JER 41:10 Ishmel dọtakwara ndị niile fọdụrụ nʼime Mizpa nʼagha. Ọ dọtara ụmụ ndị inyom eze nʼagha, dọtakwa ndị ahụ niile a hapụrụ nʼebe ahụ, bụ ndị ahụ Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze mere ka Gedaliya nwa Ahikam bụrụ onye na-achị ha. Ishmel nwa Netanaya dọtara ha niile nʼagha duru ha na-achọ ịgbapụ gaa nʼala ndị Amọn.
JER 41:11 Mgbe Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile ya na ha nọ nụrụ ihe ọjọọ Ishmel nwa Netanaya mere,
JER 41:12 ha duuru ndị agha ha niile pụọ ibuso Ishmel nwa Netanaya agha. Ha chụkwutere ya nʼebe dị nso nʼiyi ukwu Gibiọn.
JER 41:13 Mgbe ndị ahụ niile Ishmel dọtara nʼagha hụrụ Johanan nwa Kariya na ndịisi agha so ya, ha ṅụrịrị ọṅụ.
JER 41:14 Ndị ahụ niile Ishmel dọtara nʼagha na Mizpa, chigharịrị gafee nʼebe Johanan nwa Kariya nọ.
JER 41:15 Ma Ishmel nwa Netanaya, na mmadụ asatọ nʼime ndị agha ya, gbapụrụ ọsọ gbanarị Johanan. Ha gbalagara nʼala ndị Amọn.
JER 41:16 Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha niile ya na ha so duuru ndị ahụ niile ha napụtara site nʼaka Ishmel pụọ, bụ ndị ahụ Ishmel nwa Netanaya dọtara nʼagha na Mizpa, mgbe o buuru ụzọ gbuo Gedaliya nwa Ahikam. Ndị ọzọ Johanan si na Gibiọn durukwa bụ ndị a, ndị agha, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ndịisi ụlọ ikpe.
JER 41:17 Ha duuru ha na-aga, ma kwụsị nʼobodo Gerut Kimham, nke dị nso na Betlehem, ebe ha bu nʼobi ịga Ijipt,
JER 41:18 nʼihi ịgbanarị ndị Babilọn. Ha tụrụ egwu ihe ndị Babilọn ga-eme ha nʼihi ogbugbu Ishmel nwa Netanaya gburu Gedaliya nwa Ahikam, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ bụrụ onye na-achị ala ahụ.
JER 42:1 Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile, na Jezenaya nwa Hoshaya, na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu, bịakwutere
JER 42:2 Jeremaya onye amụma sị ya, “Biko, anyị bịara ịrịọ gị arịrịọ. Kpọkuo Onyenwe anyị Chineke gị nʼekpere nʼihi anyị bụ ndị fọdụrụ nʼala a. Ị maara na o nwere oge anyị dị ọtụtụ nʼala a, ma ugbu a anyị dị naanị ole na ole.
JER 42:3 Kpee ekpere ka Onyenwe anyị Chineke gị gosi anyị ihe anyị ga-eme, maọbụ ebe anyị ga-eje.”
JER 42:4 Jeremaya onye amụma zara sị ha, “Anụla m ihe unu kwuru. Aga m ekpere Onyenwe anyị Chineke unu ekpere dịka unu rịọrọ. Mgbe m natara ọsịsa ya, aga m agwakwa unu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. O nwekwaghị ihe m ga-ezonarị unu.”
JER 42:5 Ha sịrị Jeremaya, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onyeama eziokwu na nke kwesiri ntụkwasị obi megide anyị, ma ọ bụrụ na anyị emeghị dịka ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị gwara gị ka ị gwa anyị.
JER 42:6 Ọ bụ ihe Chineke, onye anyị na-eziga gị ka ị jụta ase, kwuru ka anyị ga-eme. Ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ. Anyị ga-erubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, ka ihe gaara anyị nke ọma.”
JER 42:7 Mgbe ụbọchị iri gasịrị okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị.
JER 42:8 Nʼihi ya ọ kpọrọ Johanan nwa Kariya, ndịisi agha ya na ha so na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.
JER 42:9 Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, onye unu zigara m ka m wegara arịrịọ unu, sịrị:
JER 42:10 ‘Ọ bụrụ na unu anọgide nʼala a, aga m ewuli unu elu; agaghị m akwada unu. Aga m akụkwa unu dịka osisi, gharakwa ihopu unu. Nʼihi na ihe ọjọọ ahụ m mere ka ọ bịakwasị unu na-ewute m nke ukwuu.
JER 42:11 Unu atụla eze Babilọn egwu, bụ onye unu na-atụ egwu ya ugbu a. Unu atụla ya egwu, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, nʼihi na anọnyeere m unu, aga m azọpụta unu, napụtakwa unu site nʼaka ya.
JER 42:12 Aga m enwe obi ebere nʼebe unu nọ, si otu a mee ka ya onwe ya nweekwa obi ebere nʼebe unu nọ. Ọ ga-emekwa ka unu nwetaghachikwa ala unu.’
JER 42:13 “Ma ọ bụrụ na unu onwe unu asị, ‘Anyị agaghị anọgide nʼala a,’ si otu a nupu isi nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ;
JER 42:14 ọ bụrụkwa na unu asị, ‘Mba, anyị ga-aga biri nʼala Ijipt ebe anyị na-agaghị ahụ agha, maọbụ nụ ụda opi ike, maọbụ nọọ agụụ nʼihi enweghị ihe oriri,’
JER 42:15 mgbe ahụ, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị fọdụrụ na Juda. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike na mkpebi unu ịga Ijipt ibiri nʼebe ahụ, ọ bụrụkwa na unu agaa biri nʼIjipt nʼeziokwu,
JER 42:16 mgbe ahụ, mma agha ahụ unu na-atụ egwu ga-eru unu nʼahụ, ụnwụ ahụ unu na-atụ oke egwu ya ga-esoro unu baa nʼIjipt. Unu ga-anwụkwa nʼebe ahụ.
JER 42:17 Nʼezie, ndị ahụ niile kpebiri ịga biri nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe. O nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ, o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-agbanarị ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ha.’
JER 42:18 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Dịka iwe m na ọnụma m bụ ihe awụkwasịrị nʼelu ndị bi na Jerusalem, otu a ka m ga-esi wụkwasịkwa unu ọnụma m, mgbe unu ga-aga Ijipt. Unu ga-aghọ ihe ọbụbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe nkọcha na ihe ịta ụta. Unu agakwaghị ahụ ebe a anya ọzọ.’
JER 42:19 “Unu bụ ndị fọdụrụ na Juda, lee na Onyenwe anyị agwala unu sị, ‘Unu agala Ijipt.’ Matanụ nke ọma na m adọọla unu aka na ntị,
JER 42:20 na unu mehiere nʼobi unu mgbe unu ziri m sị m jụta Onyenwe anyị Chineke unu ase. Mgbe ahụ, unu rịọrọ m sị m, ‘Rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ, gwa anyị ihe niile o kwuru, anyị ga-emekwa ya.’
JER 42:21 Agwala m unu taa ihe o kwuru, ma unu ajụla ime ihe ahụ niile Onyenwe anyị Chineke unu, bụ onye unu zigara m ka m jekwuru, kwuru.
JER 42:22 Ya mere, matanụ ya nke ọma taa na unu ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe, nʼebe ahụ unu chọrọ ịga biri.”
JER 43:1 Mgbe Jeremaya gwasịrị ndị ahụ niile okwu ahụ Onyenwe anyị Chineke ha ziri ya ka o zie ha,
JER 43:2 Azaraya nwa Hoshaya, Johanan nwa Kariya na ndị nganga niile nọ nʼebe ahụ, gwara Jeremaya okwu sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka i kwuru! Onyenwe anyị Chineke anyị ezighị gị ka i kwuo na anyị ekwesighị ịga biri nʼIjipt,
JER 43:3 Kama ọ bụ Baruk nwa Neraya na-akwalị gị megide anyị, nʼihi na ọ chọrọ inyefe anyị nʼaka ndị Babilọn ka ha gbuo anyị, maọbụ buru anyị gaa Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha.”
JER 43:4 Ya mere, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha ahụ niile, nakwa ndị mmadụ ahụ niile nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụụ ịnọgide nʼala Juda.
JER 43:5 Kama Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ, duuru ndị ahụ fọdụrụ na Juda pụọ, ha na ndị ahụ si na mba ndị ọzọ dị iche iche, ebe ha gbagara lọta.
JER 43:6 Ha duuru ndị ikom niile na ndị inyom niile na ụmụntakịrị niile, na ụmụ ndị inyom eze niile, bụ ndị ahụ Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze Babilọn tinyere na nlekọta Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan na Jeremaya onye amụma na Baruk nwa Neraya.
JER 43:7 Ya mere, ha nupuru isi nʼebe Onyenwe anyị nọ site nʼịbanye ala Ijipt. Ha jegidere ije ruo nʼobodo Tapanhis.
JER 43:8 Mgbe ha nọ na Tapanhis, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
JER 43:9 “Mgbe ndị Juu nọ na-ele gị anya, chịrị ụfọdụ nkume buru ibu nʼaka gị, gaa zoo ha nʼime ụrọ dị na mpụta ihu ụlọ e ji aja ụrọ wuo, nke dị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ Fero dị na Tapanhis.
JER 43:10 Mgbe ahụ sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel sịrị, Aga m ezi ozi kpọta ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn. Aga m edokwasịkwa ocheeze ya nʼelu nkume ndị a m zoro nʼebe a, ọ ga-agbasa ụlọ ndo nke ịbụ eze ya nʼelu ha.
JER 43:11 Ọ ga-abịa buso Ijipt agha, si otu a mee ka ha nwụọ, bụ ndị ahụ a kwadobere maka ọnwụ, mee ka a dọta ha nʼagha, bụ ndị ahụ a kwadobere na-aga adọta nʼagha; mekwaa ka ha nwụọ site na mma agha bụ ndị ahụ a kwadobere na ha ga-anwụ site na mma agha.
JER 43:12 Ọ ga-esunyekwa ọkụ nʼụlọ ebe a nọ na-efe chi niile nke ndị Ijipt. Ọ ga-esure ụlọ ndị a ọkụ, dọtakwa chi ha niile nʼagha. Dịka onye ọzụzụ atụrụ si ewepụcha igwu site na uwe ya, ọ ga-esikwa otu a wezuga onwe ya nʼudo site nʼIjipt pụọ.
JER 43:13 Nʼime ụlọnsọ anyanwụ dị nʼIjipt, ka ọ ga-akwatu ogidi nsọ niile, surekwaa ụlọnsọ niile nke chi dị iche iche nʼIjipt ọkụ.’ ”
JER 44:1 Ndị a bụ okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juu ahụ niile bi nʼala Ijipt, bụ ndị bi na Migdol, na nʼime Tapanhis, na nʼime Memfis, na nʼime Patros,
JER 44:2 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu ji anya unu hụ ihe ọjọọ ahụ niile m mere ka ha bịakwasị Jerusalem, na obodo niile nke Juda. Lee, obodo ndị ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe taa, o nwekwaghị onye bi nʼime ha.
JER 44:3 Ihe ndị a bịakwasịrị ha nʼihi ihe ọjọọ ha mere. Ha kpasuru m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na site nʼife chi ndị ọzọ, ndị ha onwe ha maọbụ nna nna ha na-amaghị.
JER 44:4 Site nʼoge ruo nʼoge, mgbe mgbe, eziteere m ha ndị ohu m, bụ ndị amụma, ndị gwara ha okwu sị ha, ‘Unu emela ihe arụ dị otu a nke m kpọrọ asị!’
JER 44:5 Ma ha egeghị ntị, ha atọkwaghị ntị ha nʼala. Ha esiteghị nʼihe ọjọọ ha na-eme chegharịa, maọbụ kwụsị ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ.
JER 44:6 Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m na iwe m, nke rere dịka ọkụ megide obodo niile nke Juda, na okporoụzọ nke Jerusalem. Ya mere, ha ghọrọ mkpọmkpọ ebe na ebe tọgbọrọ nʼefu taa.
JER 44:7 “Ma ugbu a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Nʼihi gịnị ka unu ji chọọ iji aka unu wetara onwe unu ihe ọjọọ ndị a? Lee ka unu si duru ndị ikom na ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile, na ụmụ a mụrụ ọhụrụ niile na-agbala nʼala Ijipt, si otu a mee ka, ọ bụladị, otu mkpụrụ mmadụ hapụ ịfọdụkwa nʼala Juda.
JER 44:8 Gịnị mere unu na-eji ọrụ aka unu na-akpasu m iwe, na-esurere chi ndị ọzọ ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼala Ijipt, ebe unu bịara ibi? Unu onwe unu ga-ala onwe unu nʼiyi, mekwaa onwe unu ihe ịbụ ọnụ nakwa ihe nkọcha nʼetiti mba niile dị nʼụwa.
JER 44:9 Unu echefuola ihe ọjọọ nna unu ha mere na ihe ọjọọ niile ndị eze Juda na ndị eze nwanyị Juda mere na ihe ọjọọ niile nke unu onwe unu na ndị nwunye unu mekwara nʼala Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem?
JER 44:10 Ruo ụbọchị taa, o nwebeghị onye ọbụla nʼime ha wedarala onwe ya ala, maọbụ tụọ egwu m; ha adịghị ejegharị nʼiwu m, maọbụ jidesie ụkpụrụ ndị ahụ niile m debere nʼihu ha na nʼihu nna nna ha aka ike, ịgbaso ya.
JER 44:11 “Nʼihi ihe ndị a niile, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ekpebiela m ime ka ihe ọjọọ bịakwasị unu; ekpebiela m ibibi Juda.
JER 44:12 Aga m eme ka ndị ahụ niile fọdụrụ nʼala Juda, bụ ndị ahụ kpebiri nʼobi ha ịga biri nʼala Ijipt ghara ịdịkwa. A ga-ala ha nʼiyi nʼala Ijipt; ha ga-ada site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ. Ndị niile dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha na ndị niile dịkarịsịrị nta ga-anwụ. Ha ga-aghọkwa ihe ịbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe ọmụma ikpe na ihe nkọcha.
JER 44:13 Dịka m si taa Jerusalem ahụhụ, otu a ka m ga-esi jiri mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, taa ndị ahụ bi nʼIjipt ahụhụ.
JER 44:14 O nweghị onye ọbụla nʼime ndị Juda ahụ fọdụrụ, ndị gara biri nʼIjipt nke ga-agbanarị ọnwụ. Ọ bụ ezie na ọ na-agụsị ha agụụ ike ịlọghachi nʼala Juda, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-alọghachi, karịakwa mmadụ ole na ole ndị ga-agbapụ agbapụ.”
JER 44:15 Ndị nọ nʼebe ahụ mgbe ahụ Jeremaya kwuru okwu ndị a bụ ndị ikom ahụ niile maara na ndị nwunye ha na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, na ndị niile bi nʼIjipt nʼakụkụ Patros. Ndị a zara Jeremaya sị ya,
JER 44:16 “Anyị agaghị anabata okwu ahụ i si nʼaha Onyenwe anyị gwa anyị
JER 44:17 Nʼihi na anyị aghaghị ime ihe ndị ahụ anyị kpebiri ime. Anyị ga-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Anyị ga-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ dịka anyị na nna anyị ha, ndị eze anyị na ndịisi ọchịchị anyị mere nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem. Nʼoge ahụ, anyị na-eriju afọ, ihe na-agakwara anyị nke ọma, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị anyị.
JER 44:18 Ma site nʼoge anyị kwụsịrị ịchụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja, ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na ịwụsara ya aja ihe ọṅụṅụ, ihe niile akọla anyị, ọ bụkwa site na mma agha na oke ụnwụ ka anyị na-ala nʼiyi.”
JER 44:19 Ndị inyom ahụ niile kwukwara sị, “Mgbe ahụ anyị na-eji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja na mgbe ahụ anyị na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ, ọ bụ na ndị di na-alụ anyị amaghị na anyị na-eme achịcha nʼoyiyi ya, na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ?”
JER 44:20 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara mmadụ ahụ niile okwu, ma ndị ikom ma ndị inyom ahụ niile zara ya okwu sị ha,
JER 44:21 “Onyenwe anyị chetara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile unu na nna unu ha, na ndị eze unu, na ndịisi ọchịchị unu, na ndị Izrel niile ji chụọ aja nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem niile.
JER 44:22 Nʼihi ya, mgbe Onyenwe anyị na-enweghịkwa ike ịnagide ihe ọjọọ niile ndị a unu mere, na ihe arụ niile unu mere, o mere ka ala unu ghọọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, nke mmadụ na-ebighị nʼime ya, dịka ọ dị taa.
JER 44:23 Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide Onyenwe anyị, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.”
JER 44:24 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị inyom ahụ, na ndị Izrel niile okwu sị ha, “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Juda niile nọ nʼIjipt.
JER 44:25 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu na ndị nwunye unu esitela nʼomume unu gosi na unu na-emezu ihe ndị ahụ unu ji ọnụ kwuo sị, ‘Anyị aghaghị imezu nkwa niile anyị kwere banyere ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nke ihe ọṅụṅụ nye Eze nwanyị mbara Eluigwe.’ “Gaanụ nʼihu mezuo nkwa unu kwere! Mezuokwanụ iyi unu ṅụrụ.
JER 44:26 Ma nụrụkwanụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị Juu niile bi nʼIjipt, ‘Eji m aha m dị ukwuu na-aṅụ iyi,’ ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘na o nweghị onye Juda ọbụla bi nʼakụkụ ọbụla nke Ijipt, nke ga-akpọkukwa aha m ọzọ, maọbụ jiri ya ṅụọ iyi sị, “Dịka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-adị ndụ.”
JER 44:27 Nʼihi na anya m na-ele ha abụghị maka ime ha mma, kama ọ bụ maka ime ha ihe ọjọọ. Ndị Juu niile bi nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼoke ụnwụ, tutu ruo mgbe e bibichara ha dum.
JER 44:28 Naanị mmadụ ole na ole ga-esi Ijipt gbalata Juda ịgbanarị mma agha. Mgbe ahụ ndị Juda niile fọdụrụ, bụ ndị bịara biri nʼIjipt, ga-amata onye okwu ya na-eguzosi ike, maọbụ nke m, maọbụ nke ha.
JER 44:29 “ ‘Nke a ga-abụrụ unu ihe ama nke ga-egosi unu na m ga-ata unu ahụhụ nʼebe a,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ka unu si otu a mara na mba m na-aba na m ga-emesi unu ike aghaghị iguzosi ike.’
JER 44:30 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m arara Fero Hofra, eze Ijipt nyefee nʼaka ndị iro ya, bụ ndị na-achọ ndụ ya, dịka m si rara Zedekaya eze Juda, nyefee nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, bụ onye iro ahụ chọrọ ndụ ya.’ ”
JER 45:1 Okwu ndị Jeremaya onye amụma gwara Baruk nwa Neraya, mgbe o dere okwu ndị a nʼakwụkwọ dịka Jeremaya na-akpọpụta ha, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda. Jeremaya gwara Baruk sị,
JER 45:2 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel na-agwa gị, gị Baruk,
JER 45:3 Ị sịrị, ‘Ahụhụ dịịrị m! Lee na Onyenwe anyị atụkwasịrịla m mwute nʼelu ihe mgbu nke m nwere. Ike ịsụ ude agwụla m, ma ruo ugbu a, achọtabeghị m izuike.’
JER 45:4 Ma ihe ndị a ka ị ga-agwa ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Aga m akwada ihe ndị ahụ niile m wuru, hopukwa ihe ndị ahụ niile m kụrụ nʼala a niile.
JER 45:5 Ma gị onwe gị, ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? Achọkwala ha. Nʼihi na, lee, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị mmadụ niile, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ma aga m eme ka ị jiri ndụ gị gbapụ jee ebe ọbụla ị ga-eje.’ ”
JER 46:1 Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya onye amụma ntị, banyere mba dị iche iche.
JER 46:2 Nke dịrị Ijipt: Ndị a bụ okwu dị megide usuu ndị agha Fero Neko, bụ eze Ijipt, ndị Nebukadneza eze Babilọn meriri nʼagha na Kakemish, nʼakụkụ osimiri Yufretis, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya, bụ eze Juda.
JER 46:3 “Kwadoonụ ọta agha unu, ndị ukwu na ndị nta, zọpụnụ ije maka ibu agha.
JER 46:4 Kegidezienụ ịnyịnya unu, rịkwasịkwanụ nʼelu ha. Guzokwanụ nʼọnọdụ ibu agha unu, ma kpukwasịkwanụ onwe unu okpu agha unu. Mụọnụ ùbe unu ka ọ dị nkọ, yikwasịkwanụ uwe agha unu.
JER 46:5 Gịnị ka anya m abụọ hụrụ? Ụjọ na-atụ ha, ha na-agbaghachikwa azụ; lee, a na-etipịa ndị ha bụ dike nʼagha. Ha na-agbasi ọsọ ike, na-eleghị anya nʼazụ. Egwu dịkwa nʼakụkụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 46:6 “Ndị nwere ụkwụ ọsọ enweghị ike ịgbalaga, ndị dị ike enweghị ike isi nʼebe ahụ wezuga onwe ha. Ha na-asọ ngọngọ daa, nʼakụkụ ugwu dị nso nʼosimiri Yufretis.
JER 46:7 “Onye bụ onye a, nke na-ebili ọtọ dịka osimiri Naịl, na dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị?
JER 46:8 Ijipt na-ebili elu dịka osimiri Naịl, dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị. Ọ na-asị, ‘Aga m ebili kpuchie ụwa niile. Aga m ebibi obodo ukwu dị iche iche, na ndị mmadụ bi nʼime ha.’
JER 46:9 Gbabanyenụ nʼọgbọ agha, unu ịnyịnya niile. Gbanụ ọkụ ọkụ, unu ndị na-agba ụgbọ agha. Zọọnụ ike ike, unu ndị bụ dike nʼagha, unu ndị ikom Kush na Put, ndị na-ebu ọta, na unu ndị ikom Lidiya ndị na-agba ụta.
JER 46:10 Ma ụbọchị ahụ dịrị Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ọ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ ya, ụbọchị ọ ga-abọrọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya. Mma agha ga-eripịa ha tutu afọ eju ya, e, tutu ruo mgbe ọ ṅụjuru ọbara afọ. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-achụ aja nʼala ahụ dị nʼugwu, nke dị nso osimiri Yufretis.
JER 46:11 “Rigoro Gilead ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya, gị Ada Ijipt na-amaghị nwoke. Ma ọ bụ nʼefu ka ị na-ewebata ọgwụ ndị a niile, nʼihi na ọgwụgwọ ọbụla agaghị adịrị gị.
JER 46:12 Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị. Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị. Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya; ha abụọ na-adakwa nʼala.”
JER 46:13 Okwu ndị a ka Onyenwe anyị gwara Jeremaya onye amụma, banyere ọbịbịa nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn, onye na-abịa ibuso Ijipt agha.
JER 46:14 “Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol. Kwusaakwa ya na Memfis, na nʼobodo Tapanhis. Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere, nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu.
JER 46:15 Gịnị mere a ga-eji gbudasịa ndị gị niile bụ dike nʼagha? Ha agaghị enwe ike guzokwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-akwada ha.
JER 46:16 Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe, ha ga-adakwasịkwa nʼelu ibe ha. Ha ga-asịkwa, ‘Bilienụ ọtọ, bịanụ ka anyị laghachikwuru ndị anyị, ka anyị laghachikwa nʼala ebe a mụrụ anyị, ka anyị wezugakwa onwe anyị site na mma agha nke ndị mmegbu.’
JER 46:17 Nʼebe ahụ ka ha ga-anọ tie mkpu sị, ‘Fero eze Ijipt bụ naanị onye oke okwu. Lee, oge a kara aka nye ya efunarịla ya.’
JER 46:18 “Dịka mụ onwe m na-adị ndụ,” ka Eze ahụ kwupụtara, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, “otu onye ga-abịa, onye dị ukwuu dịka ugwu Taboa si dị ukwuu nʼebe ugwu ndị ọzọ dị, na dịka Kamel si dịrị nʼakụkụ osimiri.
JER 46:19 Kwakọtaanụ ngwongwo unu, jikerenụ maka ije biri nʼala ọzọ, unu ndị bi nʼIjipt, nʼihi na a ga-eme ka Memfis ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ na-agaghị ebi nʼime ya.
JER 46:20 “Ijipt mara mma dịka nne ehi, ma ijiji nke si nʼakụkụ ugwu, na-abịa imegide ya.
JER 46:21 Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti ha dịka ụmụ ehi gbara abụba. Ha onwe ha kwa ga-atụgharịa gbaa ọsọ, ha agaghị eguzo, nʼihi na ụbọchị nhụju anya na-abịakwasị ha, bụ ụbọchị a ga-ata ha ahụhụ.
JER 46:22 Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme, mgbe ndị iro ya ji ike na-abịakwasị ya. Ha ga-eji anyụike bịakwasị ya, dịka ndị na-egbutu osisi.
JER 46:23 Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼagbanyeghị na ọ bụ oke ọhịa rubigara oke. Ha dị ọtụtụ karịa igurube, a pụghịkwa ịgụta ole ha dị.
JER 46:24 A ga-eme ka ihere mee Ada Ijipt, mgbe e nyefere ya nʼaka ndị si nʼakụkụ ugwu bịa.”
JER 46:25 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, sịrị, “Ana m aga ime ka ahụhụ bịakwasị Amọn, bụ chi ndị Tibs, na Fero, na ala Ijipt na chi niile dị nʼime ya, ndị eze ya niile nakwa ndị ahụ na-atụkwasị Fero obi.
JER 46:26 Aga m enyefe ha nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike, bụ Nebukadneza eze Babilọn, na ndịisi ọchịchị ya. Ma nʼikpeazụ, aga m emekwa ka ndị mmadụ birikwa nʼime ya ọzọ, dịka e si biri nʼime ya na mgbe ochie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
JER 46:27 “Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Adakwala mba, gị Izrel. Nʼihi na lee, aghaghị m ịzọpụta gị site nʼebe dị anya nke e mere ka ị gaa biri. Aga m azọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site nʼala ebe e mere ka ha gbapụ ọsọ gaa biri. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo, na-atụghị egwu ọbụla. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ọ tụọ ụjọ.
JER 46:28 Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, nʼihi na anọnyeere m gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “A sịkwarị na m ebibie mba ndị ahụ niile nke m mere ka ị gaa biri nʼetiti ha kpamkpam, agaghị m ebibi gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị, ma ọ ga-abụ site nʼụzọ ikpe ikpe ziri ezi. Agakwaghị m ahapụ inye gị ahụhụ i kwesiri ịnata.”
JER 47:1 Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere ndị Filistia. Okwu ndị a bịara tupu Fero ebuso obodo Gaza agha.
JER 47:2 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee ka mmiri si ala elu nʼakụkụ ugwu; ha ga-aghọkwa mmiri nke na-erubiga oke. Ha ga-erukwasị ala ahụ, kpuchiekwa ihe niile dị nʼime ya, ọ ga-ekpuchikwa obodo niile dị nʼala ahụ, na ndị bi nʼime ya. Ndị niile bi nʼala ahụ ga-eti mkpu akwa, mmadụ niile ga-akwasikwa akwa ike.
JER 47:3 Mgbe ha ga-anụ ụzụ ikiri ụkwụ nke ọtụtụ ịnyịnya, nke na-agbata ọsọ na-abịa nʼebe ha nọ, mgbe ha ga-anụkwa ụzụ ụgbọ agha ndị iro, na ụzụ nzọ ụkwụ igwe ha. Nʼoge ahụ, ndị bụ nna agaghị enwe ike nyere ụmụ ha aka, nʼihi na aka ha ga-akụda nʼakụkụ ha.
JER 47:4 Nʼihi na ụbọchị ahụ abịala mgbe a ga-ebibi ndị Filistia niile, mgbe a ga-ebipụ ndị niile fọdụrụ, ndị nwere ike inyere obodo Taịa na Saịdọn aka. Nʼihi na Onyenwe anyị akwadoola ibibi ndị Filistia, o kwadoola ibibi ndị ahụ fọdụrụ nʼọnụ mmiri Kafto.
JER 47:5 Gaza ga-akpụcha isi ya nʼọnọdụ iru ụjụ. A ga-eme ka Ashkelọn dere duu. Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-egbukasị onwe unu ahụ, unu bụ ndị fọdụrụ afọdụ bi nʼala dị larịị?
JER 47:6 “ ‘Ewoo, gị mma agha Onyenwe anyị, ole mgbe ị ga-ezu ike? Mịnye onwe gị nʼọbọ gị, kwụsị ịkpa ike gị ma dere duu.’
JER 47:7 Ma ọ ga-esikwanụ aṅaa zuru ike, ebe ọ bụ Onyenwe anyị nyere ya iwu ibu agha megide Ashkelọn, na ndị bi nʼọnụ mmiri oke osimiri?”
JER 48:1 Nke a dịrị Moab: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Ahụhụ dịrị Nebo! Nʼihi na a ga-emebi ya. A ga-emekwa ka ihere mee Kiriatem, e, a ga-adọta ya nʼagha. A ga-etipịa Misgab, mee ka ihere mee ya.
JER 48:2 Ọ dịkwaghị ndị ga-eto Moab ọzọ, kama a ga-anọ na Heshbọn pịa ọpịpịa ọdịda ya. Ha ga-asị, ‘Bịanụ ka anyị bibie mba a, ka ọ ghara ịdịkwa.’ Ọ bụladị gị bụ Madmen, ka a ga-eme ka i dere duu. A ga-ejikwa mma agha chụọ gị ọsọ.
JER 48:3 Gee ntị nụrụ akwa na-ada na Horonaim, ọ bụ mkpu akwa oke mbibi na ịla nʼiyi.
JER 48:4 A ga-etikpọ Moab, ụmụntakịrị ya ga-etikwa mkpu akwa.
JER 48:5 Ha ga-eji oke ịkwa akwa na-agbago ụzọ Luhit; a ga-anụkwa mkpu akwa nke ndị e bibiri ihe ha nʼụzọ na-agbada Horonaim. A ga-anụ akwa mwute nʼihi mbibi nke bịakwasịrị ha.
JER 48:6 Gbalaganụ! Gbapụnụ ọsọ ndụ! Dịkwanụ ka osisi nta nke dị nʼọzara.
JER 48:7 Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu, a ga-adọtakwa unu nʼagha. Ndị Kemosh ka a ga-eburu gaa mba ọzọ, ha na ndị nchụaja na ndịisi ọchịchị ya.
JER 48:8 Onye mbibi ahụ ga-abịa megide obodo niile. O nwekwaghị obodo nke pụrụ ịgbanarị mbibi ya. A ga-ala ndagwurugwu niile nʼiyi, bibiekwa ebe dị elu nke dị larịị, nʼihi na ọ bụ okwu si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.
JER 48:9 Wụkwasị ala Moab nnu, nʼihi na a ga-eme ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Obodo niile dị nʼime ya ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya.
JER 48:10 “Ọbụbụ ọnụ dịrị onye ahụ ji aghụghọ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị. Ahụhụ dịrị onye na-ewezuga mma agha nʼebe iwusi ọbara dị.
JER 48:11 “Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị, ọ dịka mmanya doro edo, nke a na-adịghị esi nʼotu udu wụgharịa ya nʼime udu ọzọ, o nwebeghị oge ọbụla e ji mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. Ọ bụ ya mere ụtọ ya adịghị agbanwe agbanwe, isisi ya agbanwekwaghị.
JER 48:12 Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite, ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile.
JER 48:13 Mgbe ahụ, ihere Kemosh ga-eme Moab, dịka ihere si mee Izrel mgbe ha tụkwasịrị Betel obi ha.
JER 48:14 “Unu si aṅaa ekwu sị, ‘Ndị dị ike nʼagha ka anyị bụ; anyị bụkwa dimkpa nʼagha’?
JER 48:15 A ga-ebibi ala Moab, busokwa obodo ya niile agha. Ụmụ okorobịa ya niile ndị ahọrọ ahọ ga-ada nʼogbugbu ahụ.” Otu a ka Eze ahụ kwubiri, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
JER 48:16 “Ọdịda Moab dị nso; oke nhụju anya ya ga-abịakwa ọsịịsọ.
JER 48:17 Kasịenụ ya obi, unu ndị niile gbara ya gburugburu, unu ndị niile maara na ọ bụ mba dị ukwuu. Kwupụtanụ sị, ‘Esi aṅa gbajie mkpanaka eze a, nke dị ike, lee ka e si gbajiekwa mkpanaka a nke dị ebube!’
JER 48:18 “Sitenụ nʼebe nsọpụrụ unu dị elu rịdata, bịa nọdụnụ nʼala kpọrọ nkụ, unu ndị bi nʼobodo bụ Ada Dibọn. Nʼihi na onye ahụ bibiri Moab ga-abịa ibu agha megide unu, ọ ga-alakwa obodo unu niile e wusiri ike nʼiyi.
JER 48:19 Guzonụ nʼakụkụ ụzọ, hụrụ ihe na-eme, unu ndị bi nʼime Aroea. Jụọnụ nwoke unu hụrụ na-agba ọsọ, na nwanyị nke na-ewezuga onwe ya ajụjụ sị ha, ‘Gịnị mere?’
JER 48:20 E meela ka ihere mee Moab, nʼihi na a tụpịala ya. Kwasienụ akwa ike, tiekwanụ mkpu akwa. Kwupụta ya nʼAnọn na e bibiela Moab.
JER 48:21 Oge a ga-ekpe ndị bi nʼala dị larịị ikpe abịala, bụ ndị bi na Họlọn, Jahaz na Mefaat,
JER 48:22 Dibọn, Nebo na Bet-Diblataim,
JER 48:23 Kiriatem, Bet-Gamul na Bet-Meon,
JER 48:24 Keriọt na Bozra, na obodo niile dị nʼala Moab, ndị dị nso, na ndị nke dị anya.
JER 48:25 E bipụla mpi Moab, a gbajiekwala ogwe aka ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 48:26 “Meenụ ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, nʼihi na o nupuru isi megide Onyenwe anyị. Moab ga-atụrụ onwe ya nʼihe ọ gbọrọ. Ọ ga-aghọkwa ihe ọchị.
JER 48:27 Izrel ọ bụghị ihe ọchị nye gị? Ọ bụ nʼetiti ndị na-ezu ohi ka e jidere ya, mere i ji na-efufere ya isi mgbe ọbụla ị na-ekwu okwu banyere ya?
JER 48:28 Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume, unu ndị bi nʼala Moab. Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume.
JER 48:29 “Anyị anụla ihe banyere mpako Moab. Anyị anụla na mpako ahụ dị ukwuu, nụkwa ihe banyere oke mbuli elu nke ọ na-ebuli onwe ya, na oke nganga nke obi ya.
JER 48:30 Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla. Ịnya isi ya agaghị arụpụtakwa ihe ọbụla, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
JER 48:31 Nʼihi ya, aga m akwasị akwa ike nʼihi Moab, aga m eti mkpu akwa nʼihi ala Moab niile. Aga m asụ ude akwa nʼihi ndị Kia Hareset.
JER 48:32 Akwa nke karịrị akwa Jeza ka m ga-akwa nʼihi gị, gị osisi vaịnị dị na Sibma. Alaka gị gbasara ruo nʼakụkụ osimiri, e, ha gbasara ruo nʼosimiri Jeza. Ma onye mbibi abịakwasịla mkpụrụ gị niile chara acha, e, ọ bịakwasịla mkpụrụ vaịnị gị niile.
JER 48:33 Ọṅụ na obi ụtọ ka e wepụrụ site nʼubi vaịnị niile, na nʼala ubi niile nke Moab. E meela ka mmanya vaịnị kwụsị ịgbapụtakwa site nʼebe ịzọcha mmanya. Ọ dịkwaghị onye na-eji mkpu ọṅụ na-azọcha ha, Ọ bụ ezie na a na-anụ olu iti mkpu, ma ọ bụghị olu iti mkpu ọṅụ.
JER 48:34 “A na-anụ ụda iti mkpu akwa ha site nʼobodo Heshbọn ruo Eleale, na Jehaz. A na-anụkwa ya site na Zoa ruo, ọ bụladị obodo ndị dị anya, dịka Horonaim, na Eglat Shelishiya. Nʼihi na mmiri niile nke Nimrim ataala.
JER 48:35 Aga m eme ka ndị ahụ niile na-achụ aja nʼebe niile dị elu, na ndị ahụ niile na-achụrụ chi ha dị iche iche aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, hapụ ịdịkwa nʼala Moab,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 48:36 “Ụda akwa nke na-ada nʼime obi m nʼihi Moab dịka ụda ọja. Ụda akwa nke dịkwa ka ụda ọja na-adakwa nʼime obi m nʼihi ndị Kia Hareset. Akụ niile ha kpakọtara alaala nʼiyi.
JER 48:37 A kpụchapụla agịrị isi niile, kpachakwa afụọnụ ha niile. E bipụkwala aka ha niile. Ọ bụkwa akwa mkpe ka e ji kpuchie ukwu niile.
JER 48:38 Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab, nakwa nʼama egwuregwu niile, ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ. Nʼihi na e tiwaala m Moab dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
JER 48:39 “Lee ka e si tipịa ya! Lee ka ha si akwasị akwa ike! Leekwa ka Moab si gbakụta azụ ya nʼihi ọnọdụ ihere ya! Moab aghọọla ihe ọchị, ọ ghọọla ihe iju anya nye ndị niile gbara ya gburugburu.”
JER 48:40 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ọ dị otu ugo na-efedata, nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile.
JER 48:41 A ga-adọta Keriọt nʼagha, meriekwa ebe ya niile e wusiri ike. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bụ dike nʼagha nʼala Moab ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.
JER 48:42 A ga-ebibi obodo Moab, mee ya ka ọ ghara ịdịkwa, nʼihi na ọ kagidere Onyenwe anyị anya.
JER 48:43 Oke egwu na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya nọ na-eche unu, unu ndị Moab,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 48:44 “Nʼoge ahụ, onye ọbụla gbapụrụ ọsọ site nʼihe oke egwu ga-adaba nʼolulu. Onye ọbụla ga-esikwa nʼolulu rịpụta ka igbudu ga-ejide. Nʼihi na aga m eme ka afọ ahụ a kara aka maka ịta Moab ahụhụ bịakwasị ya,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
JER 48:45 “Nʼokpuru ndo Heshbọn ka ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ guzoro, na-enweghị onye inyeaka. Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn rere na-aga; ire ọkụ dị ukwuu esitela nʼetiti Saịhọn na-apụ, na-erepịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ahụ ji oke ụzụ na-anya isi.
JER 48:46 Ahụhụ dịrị gị, gị Moab! Ebibiela ndị Kemosh niile. A dọtakwala ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom nʼagha, buru ha gaa mba ọzọ.
JER 48:47 “Ma emesịa, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, aga m eme ka ndị Moab a dọtara nʼagha lọghachi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. Nke a bụ ọgwụgwụ ikpe ọmụma dịrị Moab.
JER 49:1 Nke a dịrị ndị Amọn: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ na Izrel enweghị ụmụ ndị ikom? Izrel o nweghị onye nnweta ihe o nwere? Gịnị mere Molek ji nweta obodo Gad? Gịnị mere ndị ya ji bichie obodo ya niile?
JER 49:2 Ma ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka a nụ ụda iti mkpu agha, nke a ga-eti megide Raba, obodo ndị Amọn. A ga-eme ya ka ọ ghọọ mkputamkpu ebe. A ga-esurekwa ya ọkụ, ya na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Mgbe ahụ Izrel ga-achụpụkwa ndị ahụ niile chụpụrụ ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
JER 49:3 “Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai! Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba! Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ; gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu, nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha, buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ.
JER 49:4 Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu nke na-amị mkpụrụ hiri nne, gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya, gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’
JER 49:5 Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburu mee ka oke egwu bịakwasị gị,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya, “A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu. Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ.
JER 49:6 “Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 49:7 Nke dịrị Edọm: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman? Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta? Amamihe ha o reela ure?
JER 49:8 Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan. Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi, nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ, nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ.
JER 49:9 Ọ bụrụ na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị, ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole? Ọ bụrụkwa na ndị ohi abịa nʼabalị, ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-akwakọrọ?
JER 49:10 Ma aga m agba Ịsọ ọtọ. Aga m ekpughe ebe nzuzo ya niile ka ọ ghara izobe onwe ya. Ụmụ ya na ndị ikwu ya, tinyere ndị ya na ha dị na mma na ndị agbataobi ya, ga-ala nʼiyi. Ya mere, ọ dịghịkwa onye ga-asị,
JER 49:11 ‘Hapụnụ ụmụ mgbei unu niile, nʼihi na mụ onwe m ga-edebe ha ndụ. Ndị inyom unu niile ndị di ha nwụrụ nwere ike ịtụkwasị m obi.’ ”
JER 49:12 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na e mere ka ndị ahụ na-ekwesighị ịṅụ ihe dị nʼiko ahụ ṅụọ ya, a ga-esi aṅaa ghara ịta gị ahụhụ? A ghaghị ịta gị ahụhụ; ị ghakwaghị ịṅụ site nʼiko ahụ.”
JER 49:13 “Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.”
JER 49:14 Anụla m ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị. E zipụla onyeozi ka ọ ga mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Chịkọtaanụ onwe, megide ya. Bilikwanụ maka ibu agha!”
JER 49:15 Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche, ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ.
JER 49:16 Ịdị egwu gị nke na-eyinye ndị mmadụ egwu, na nganga nke obi gị eduhiela gị, gị onye na-ebi na mgbawa niile nke nkume dị elu, gị onye ji ebe niile dị elu nke ugwu nʼaka ya. A sịkwarị na i wuo akwụ gị nʼebe dị elu, dịka ebe ugo ga-ewu akwụ ya, aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
JER 49:17 “Edọm ga-aghọ ihe iju anya. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile.
JER 49:18 Dịka a kwaturu Sọdọm na Gọmọra, ya na obodo niile gbara ya gburugburu. Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ; nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
JER 49:19 “Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ. Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya? Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu? Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”
JER 49:20 Nʼihi nke a, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Edọm, nụrụkwa ihe o zubere megide ndị bi na Teman. A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a.
JER 49:21 Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda ha; iti mkpu akwa ha ga-adakwa ụda ruo nʼOsimiri Uhie.
JER 49:22 Lee, otu ugo ga-efeli elu, fedatakwa. Ọ ga-agbasapụ nku ya kpuchie ala Bozra niile. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bu dike nʼagha nʼEdọm ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.
JER 49:23 Nke dịrị Damaskọs: “Ụjọ ejula Hamat na Apad obi, nʼihi na ha anụla akụkọ ọjọọ. Ha adaala mba, nọọkwa nʼoke echiche dịka osimiri nke ebili na-amagharị nʼelu ya.
JER 49:24 Damaskọs aghọọla onye ike gwụrụ. Ọ tụgharịala ịgbapụ ọsọ, ma ọma jijiji ejidela ya. Oke obi ụfụ na ihe mgbu ejidesiela ya aka ike, dịka obi ụfụ na ihe mgbu nke na-ejide nwanyị ime na-eme.
JER 49:25 Gịnị mere na-agbahapụbeghị obodo ahụ a maara aha ya, bụ obodo ahụ nke ihe ya na-atọ obi m ụtọ?
JER 49:26 Nʼezie, ụmụ okorobịa nọ nʼime ya ga-ada nʼokporoụzọ niile, a ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
JER 49:27 “Aga m esunye mgbidi Damaskọs ọkụ. Ọkụ ahụ ga-eripịakwa ebe e wusiri ike nke Ben-Hadad.”
JER 49:28 Banyere Keda na alaeze Hazọ, nke Nebukadneza eze Babilọn busoro agha: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Bilienụ gaa buso Keda agha. Bibiekwanụ ndị ahụ niile bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
JER 49:29 A ga-adọta ụlọ ikwu ha, na igwe ewu na atụrụ ha nʼagha. A ga-ebukọrọkwa ụlọ mgbochi ha niile, ya na ngwongwo na ịnyịnya kamel ha niile. Ndị mmadụ ga-etikwa mkpu sị ha, ‘Oke egwu dị nʼakụkụ niile!’
JER 49:30 “Gbalaganụ ọsịịsọ. Jeenụ nọdụ nʼime ọgba nkume niile miri emi, unu ndị niile bi na Hazọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Nebukadneza eze Babilọn atụọla atụmatụ megide unu, o chepụtakwala ụzọ ọ ga-esi megide unu.
JER 49:31 “Bilienụ, gaa buso mba ahụ agha, bụ mba ahụ na-ebi na ntụkwasị obi,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mba nke na-enweghị ibo ọnụ ụzọ, maọbụ mkpọrọ e ji akpọchi ya, mba ahụ nke ndị ya na-ebiri naanị onwe ha.
JER 49:32 Ịnyịnya kamel ha ga-abụ ihe a ga-akwata nʼagha, ọtụtụ igwe ehi ha ga-abụkwa ihe a ga-alụta nʼagha. Aga m efesa ha nye ifufe, bụ ndị niile nọ ebe dị anya, bụ ndị ahụ niile na-akpụchapụ agịrị isi egedege ihu ha. Aga m emekwa ka ihe ọjọọ si nʼakụkụ niile bịakwasị ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 49:33 “Mgbe ahụ, Hazọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa. Ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. O nweghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ, nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”
JER 49:34 Nke a bụ okwu Onyenwe anyị ndị ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Elam, mgbe Zedekaya eze Juda bidoro ọchịchị ya.
JER 49:35 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m agbaji ụta nke Elam, bụ ụta ahụ ha ji anya isi na ọ bụ ebe ike ha dị.
JER 49:36 Aga m esite nʼakụkụ anọ nke mbara eluigwe zite oke ifufe anọ, nke ga-abịa megide Elam. Aga m efesa ha nye oke ifufe anọ ndị a, ndị ga-ebufu ha buga ha na mba niile dị iche iche, ọ dịghị obodo a na-agaghị ahụ ndị Ilam a dọtara nʼagha.
JER 49:37 Aga m etipịa Elam nʼihu ndị iro ha, e, nʼihu ndị ahụ na-achọsi ndụ ya ike. Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ha, meekwa ka oke iwe m dị ọkụ bịakwasị ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m mere ka ha niile gwụsịa.
JER 49:38 Aga m edo ocheeze m nʼElam, bibiekwa eze ya na ndịisi ọchịchị ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 49:39 “Ma nʼikpeazụ, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, aga m eweghachite akụnụba niile nke Elam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
JER 50:1 Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Babilọn na banyere ala ndị Babilọn.
JER 50:2 “Kwusaa ya na mba niile, mee ka a nụrụ ya; bulie ọkọlọtọ mgbe a na-ekwusa ya. Kwupụta ihe niile, ezokwala ihe ọbụla, kama kwusaa ya sị, ‘A ga-adọta Babilọn nʼagha. Ihere ga-emesịa mee Bel; otu a kwa, egwu ga-ejupụta Maduk obi. A ga-eme ka ihere mee oyiyi ya niile a kpụrụ akpụ; oke egwu ga-ejidekwa arụsị ya niile.’
JER 50:3 Otu mba, nke si nʼakụkụ ugwu, ga-ebuso ya agha, mee ala ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya, nʼihi na mmadụ na anụmanụ ga-esi nʼime ya gbalaga.
JER 50:4 “Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ndị Izrel na ndị Juda ga-ejikọta onwe ha nʼotu. Ha niile ga-eji anya mmiri pụọ ịchọ Onyenwe anyị Chineke ha.
JER 50:5 Ha ga-ajụ ajụjụ, banyere ụzọ e si eje Zayọn. Mgbe ahụ, ha ga-eche ihu ha ijeru nʼebe ahụ. Ha niile ga-abịakwa were onwe ha nyefee nʼaka Onyenwe anyị, nʼime ọgbụgba ndụ ebighị ebi, nke a na-agaghị echefu echefu.
JER 50:6 “Ndị m akpafuola dịka atụrụ furu efu. Ndị ọzụzụ atụrụ ha eduhiela ha, mee ka ha na-awagharị nʼugwu ukwu niile. Ha na-akpagharị nʼelu ugwu ukwu, ma nʼelu ugwu nta. Ha echefuokwala ebe izuike nke ha.
JER 50:7 Nʼihi ya, ndị niile chọtara ha na-eripịa ha. Ndị iro ha na-ekwukwa sị, ‘Ikpe amaghị anyị nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị, onye bụ ezi ebe ịta nri ha, na onye bụkwa olileanya nke nna nna ha.’
JER 50:8 “Sinụ na Babilọn gbalaga; sitekwanụ nʼala Babilọn pụọ, dịrịnụ ka mkpi na-edu igwe ewu na atụrụ.
JER 50:9 Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu, ndị ga-ejikọta onwe ha ibuso Babilọn agha. Ha ga-edo onwe ha nʼusoro imegide ya; ọ bụkwa nʼakụkụ ugwu ka ha ga-esi dọta ya nʼagha. Àkụ ha ga-agba ga-adị ka àkụ nke onye bụ dike nʼagha na onye ọka ịgba ụta na-agba. Ha agaghị agba aka lọta.
JER 50:10 Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha. Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 50:11 “Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ, gị onye bibiri ihe nketa m, ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka, bee akwa dịka oke ịnyịnya.
JER 50:12 Ihere ga-eme nne unu, e, a ga-eme ka oke ihere mee nne mụrụ unu. Ọ ga-abụkwa mba dịkarịsịrị ala nʼetiti mba niile, bụrụkwa ọzara, ala kpọrọ nkụ na ala uzuzu.
JER 50:13 Nʼihi iwe dị ukwuu nke Onyenwe anyị, ọ dịghị onye ga-ebikwa nʼala Babilọn ọzọ, nʼihi na a ga-ebibi ya kpamkpam. Ndị niile si nʼakụkụ ya na-agafe ka ọ ga-eju anya. Ha ga-akparị ya nʼihi ọnya niile dị ya nʼahụ.
JER 50:14 “Doonụ onwe unu nʼusoro gburugburu obodo Babilọn, unu ndị niile na-agba ụta. Gbaanụ ya ụta. Unu echela banyere àkụ ole unu ga-agbapụ nʼihi na o mehiela megide Onyenwe anyị.
JER 50:15 Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile! Ọ chiliela aka ya elu. Lee, ụlọ elu ya e wusiri ike adaala, a kwatuokwala mgbidi ya niile. Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị na-abọrọ onwe ya ọbọ nʼahụ Babilọn, bọọnụ ya ọbọ. Meenụ ya dịka o si mee ndị ọzọ.
JER 50:16 Site na Babilọn wezuga onye na-agha mkpụrụ na onye ji mma owuwe ihe ubi na-ewe ihe ubi. Ka onye ọbụla laghachikwuru ndị nke ya, ka onye ọbụla gbalaakwa nʼala nke aka ya, nʼihi mma agha nke onye na-emegbu emegbu.
JER 50:17 “Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị, nke ọdụm chụsasịrị. Onye bu ụzọ ripịa ya bụ eze Asịrịa. Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ ya bụ Nebukadneza, eze Babilọn.”
JER 50:18 Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Aga m ata eze Babilọn, na ndị ala ya ahụhụ, dịka m si taa eze Asịrịa ahụhụ.
JER 50:19 Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha. Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan. Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gilead ka afọ ga-ejukwa ha.
JER 50:20 Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “a ga-achọ ajọọ omume nke Izrel, ma ọ dịghị nke a ga-achọta. A ga-achọkwa mmehie niile nke Juda, ma o nweghị nke a ga-achọta, nʼihi na aga m agbaghara ndị ahụ m mere ka ha fọdụ mmehie ha.
JER 50:21 “Busonụ ala Merataim agha, busokwanụ ndị bi na Pekod agha. Chụọ ha ọsọ, gbuchapụ ma bibiekwa ha niile kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mezuonụ ihe niile m nyere unu nʼiwu.
JER 50:22 A na-anụ ụzụ agha nʼala ahụ, a na-anụ ụzụ oke mbibi.
JER 50:23 Lee ka e si gbajie, ma tipịa mkpirisi igwe ahụ na-esupịa ụwa niile. Lee ka Babilọn si tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mba niile nke ụwa.
JER 50:24 Esiiri m gị ọnya, gị Babilọn; ị makwara nʼọnya ahụ tupu ị mata na ọnya ahụ dị. A chọtala gị, jidekwa gị, nʼihi na i doola onwe gị ibuso Onyenwe anyị agha.
JER 50:25 Onyenwe anyị emegheela ụlọakụ ngwa agha ya, site nʼime ya wepụta ngwa agha nke ọnụma ya. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nwere ọrụ ọ ga-arụ nʼala Babilọn.
JER 50:26 Sitenụ nʼebe dị anya bịa buso ya agha. Kụkapunụ ọba ya niile, tụkọtanụ ha ọnụ dịka akpa ọka dị ukwuu, nke atụkọtara nʼelu ibe ha. Bibienụ ya kpamkpam, ka ihe ọbụla ghakwara ịfọdụrụ ya.
JER 50:27 Gbuonụ ụmụ oke ehi ya niile, ka ha niile gaa nʼebe ụlọ igbu anụ Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ụbọchị ahụ a kara aka banyere ha abịala, bụ oge a ga-eji taa ha ahụhụ.
JER 50:28 Geenụ ntị nʼihe ndị na-agbalaga na-ekwu, bụ ndị si na Babilọn na-agbapụ ọsọ. Ha na-ekwusa na Zayọn otu Onyenwe anyị Chineke anyị si bọọ ọbọ, otu o si abọ ọbọ nʼihi ụlọnsọ ukwu ya.
JER 50:29 “Kpọkọtanụ ndị na-agba ụta maka imegide Babilọn, bụ ndị niile na-agba ụta. Maanụ ụlọ ikwu, gbaa ya gburugburu; unu ekwela ka onye ọbụla si nʼime ya gbapụ. Kwụghachi ya ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, dịka ihe niile ahụ o mere si dị meenụ ya otu ahụ. Nʼihi na o buliela onwe ya elu megide Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nke Izrel.
JER 50:30 Nʼihi ya, ụmụ okorobịa ya ga-ada nʼokporoụzọ ama niile. A ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 50:31 “Lee, edoola m onwe m imegide gị, gị onye nganga.” Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. “Nʼihi na ụbọchị gị abịala, bụ oge ahụ a ga-ata gị ahụhụ.
JER 50:32 Onye nganga ahụ ga-asọ ngọngọ daa, ma o nweghị onye ga-enyere ya aka ka o bilitekwa. Aga m esunye obodo ya niile ọkụ, nke ga-erechapụ ndị niile gbara ya gburugburu.”
JER 50:33 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “A na-emegbu nnọọ ndị Izrel, nʼotu aka ahụkwa, ndị Juda. Ndị dọtara ha nʼagha jidesiri ha aka ike. Ha adịghị ahapụ ha ka ha laa.
JER 50:34 Ma Onye mgbapụta ha dị ike. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụkwa aha ya. Ọ ga-eji ike ya niile kpepụta ọnụ ha, ime ka ala ha nweekwa izuike, ma meekwa ka ndị bi na Babilọn ghara inwe izuike.
JER 50:35 “Mma agha ga-ebili megide ndị Babilọn niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “na ndị ahụ niile bi na Babilọn ma megidekwa ndịisi ọchịchị niile na ndị ahụ niile maara ihe.
JER 50:36 Mma agha ga-ebili megide ndị amụma ụgha ha niile. Ha ga-aghọ ndị nzuzu. Mma agha ga-ebili megide ndị bụ dike nʼagha. Obi ha ga-ejupụtakwa nʼoke egwu.
JER 50:37 Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha, na ndị mba ọzọ niile nọ nʼetiti ha. Ha ga-aghọkwa ndị inyom. Mma agha ga-ebilikwa megide akụ ha niile. A ga-alụta ha niile nʼagha.
JER 50:38 Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niile mee ka ha taa. Nʼihi na ala ha bụ ala arụsị: arụsị ha niile ga-ayịkwa ara nʼihi oke egwu nke ga-abịakwasị ha.
JER 50:39 “Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ. Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ. Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ. O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
JER 50:40 Dịka m si kwatuo Sọdọm na Gọmọra, ya na obodo niile gbara ya gburugburu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ; nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”
JER 50:41 “Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa; mba dị ukwuu na ọtụtụ ndị eze ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa.
JER 50:42 Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe; ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Babilọn.
JER 50:43 Eze Babilọn nụrụ akụkọ banyere ude ha, akụkọ mere ka ike gwụrụ aka ya abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu ejidela ya, ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme.
JER 50:44 Lee, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ, nʼotu ntabi anya ka m ga-esi nʼala ya chụpụ Babilọn. Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka? Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu? Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”
JER 50:45 Nʼihi ya, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Babilọn, nụrụkwa ihe o zubere megide ala ndị Babilọn. A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ. Ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a.
JER 50:46 Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda Babilọn, iti mkpu akwa ya ga-adakwa ụda nʼetiti mba niile dị iche iche.
JER 51:1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, aga m akpali mmụọ onye mbibi, ka ọ bịa megide Babilọn na ndị bi na Kaldịa.
JER 51:2 Aga m eziga ndị mba ọzọ nʼobodo Babilọn, ka ha gaa fụchaa ya, bibiekwa ala ya. Ha ga-emegide ya nʼakụkụ niile, nʼụbọchị ahụ ihe ọjọọ ga-abịakwasị ya.
JER 51:3 Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya, ekwekwala ka o yikwasị uwe agha ya. Enwekwala ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa ya nọ, kama bibie usuu ndị agha ya kpamkpam.
JER 51:4 Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn, ha ga-abụ ndị e merụrụ oke ahụ nʼokporoụzọ niile.
JER 51:5 Ọ bụ ezie nʼala ha jupụtara nʼikpe ọmụma, nʼihu Onye nsọ nke Izrel, ma Chineke bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agbakụtabeghị ndị Izrel na Juda azụ.
JER 51:6 “Sinụ na Babilọn gbapụ ọsọ. Gbasienụ ọsọ ike nʼihi ndụ unu. Unu ekwela ka e bibie unu nʼihi mmehie ya. Oge ịbọ ọbọ Onyenwe anyị eruola, ọ ga-akwụghachi ya ihe ruuru ya.
JER 51:7 Babilọn dị ka iko ọlaedo nʼaka Onyenwe anyị. O mere ka ụwa niile si nʼiko ahụ ṅụbiga ihe ọṅụṅụ oke. Mba niile nke ụwa ṅụrụ mmanya ya. Ugbu a ha niile na-ayị ara.
JER 51:8 Na mberede, Babilọn ga-ada, a ga-etipịakwa ya. Kwasierenụ ya akwa ike. Wetanụ ọgwụ tee ya, ma eleghị anya ọnya ahụ ga-adị ya mma.
JER 51:9 “ ‘Anyị gaara agwọ Babilọn, ma ọrịa ji ya enweghị ngwọta. Ka anyị hapụnụ ya; ka anyị niile nʼotu nʼotu laghachi nʼobodo nke aka anyị, nʼihi na ikpe ọmụma dịrị ya eruola mbara eluigwe. Ọ na-arịgokwa ruo nʼigwe ojii.’
JER 51:10 “ ‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè. Ka anyị kwupụta ihe Onyenwe anyị Chineke anyị mere na Zayọn.’
JER 51:11 “Mụọnụ ọnụ àkụ unu; bulienụ ọta unu! Onyenwe anyị akwaliela ndị eze ndị Midia, nʼihi na nzube ya bụ ịla Babilọn nʼiyi. Onyenwe anyị ga-abọrọ onwe ya ọbọ, ọ ga-abọtara ụlọnsọ ukwu ya ọbọ.
JER 51:12 Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn. Tinyekwanụ ndị agha ọzọ nʼetiti ndị nche, ka ọnụọgụgụ ha hie nne Kwadoonụ ndị ga na-elepụ anya. Kwadoonụ ndị agha ga-ezo onwe ha, nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ihe o zubere mezuo, bụ ihe ahụ o kpebiri megide ndị Babilọn.
JER 51:13 Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ndị nwere akụnụba dị ukwuu, ọgwụgwụ unu abịaruola. Oge ahụ eruola mgbe e ji wezuga unu.
JER 51:14 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ji onwe ya ṅụọ iyi, sị, Nʼezie, aga m eme ka ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ga-aha ka igurube jupụta nʼime gị. Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ megide gị.
JER 51:15 “O sitere nʼike ya mee ụwa; ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya, ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
JER 51:16 Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa. Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie. Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo, na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya na-ewepụta ifufe.
JER 51:17 “Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ. Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ. Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ; ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.
JER 51:18 Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo, mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.
JER 51:19 Ma onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a, nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile, tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
JER 51:20 “Ị bụ mkpọrọ osisi m ji ebu agha, na ngwa agha m ga-eji gaa nʼihu agha. Gị ka m ga-eji tipịa mba niile dị iche iche, gị ka m ga-eji laa alaeze niile nʼiyi;
JER 51:21 gị ka m ga-eji tipịa ịnyịnya na onye na-agba ya, gị ka m ga-eji tipịa ụgbọ agha na onye na-anya ya;
JER 51:22 gị ka m ga-eji tipịa nwoke na nwanyị, gị ka m ga-eji tipịa agadi nwoke na okorobịa, gị ka m ga-eji tipịa okorobịa na nwaagbọghọ,
JER 51:23 gị ka m ga-eji tipịa onye ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ya, gị ka m ga-eji tipịa onye ọrụ ubi na ehi ya; gị ka m ga-ejikwa tipịa ndị na-achị achị na ndịisi ọchịchị eze.
JER 51:24 “Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.
JER 51:25 “Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe, gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m esetipụ aka m megide gị, kwapụ gị site na nkume dị elu. Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ.
JER 51:26 A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ, maọbụ nke e ji ewu ntọala ụlọ ọbụla, nʼihi na ị ga-abụ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
JER 51:27 “Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ. Fụọnụ opi ike nʼetiti mba niile. Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ya; kpọkuonụ alaeze ndị a niile imegide ya: Ararat, na Mini, na Ashkenaz. Họpụtanụ ọchịagha ga-edu usuu ndị agha megide ya; ziganụ ịnyịnya ga-adị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka igurube.
JER 51:28 Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha, kwadoonụ ndị eze Midia, na ndị ha na-achị achị, na ndịisi ọchịchị, na mba niile nke ha na-achị.
JER 51:29 Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu, nʼihi na nzube Onyenwe anyị zubere megide Babilọn ga-emezu. Ọ ga-eme ka ala Babilọn ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya.
JER 51:30 Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ; ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike. Ike agwụla ha; ha adịla ka ndị inyom. E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ, tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile.
JER 51:31 Otu onye na-agba ọsọ na-agbaso ọgba ọsọ ibe ya, otu onyeozi na-esochikwa onyeozi ọzọ nʼazụ; ha niile na-abịa izi eze Babilọn ozi sị ya na a dọtala obodo ya nʼagha,
JER 51:32 na ndị iro anọchiela ụzọ e si agafe iyi, na e sunyela ala mmiri mmiri niile ọkụ, na ndị agha niile na-amakwa jijiji.”
JER 51:33 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Ada Babilọn dịka ebe ịzọcha ọka, nʼoge a na-azọcha ya. Mgbe a ga-ewe ya dịka e si ewe ihe ubi na-abịa nso.”
JER 51:34 “Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị, o tinyela anyị nʼọnọdụ mgbagwoju anya. O meela ka anyị dịrị ka ite ihe na-adịghị nʼime ya. O lodara anyị dịka ọ bụ agwọ ọjọọ, jiri ihe ụtọ anyị niile mejuo afọ ya. Emesịa, ọ gbọpụtara anyị.
JER 51:35 Ka ihe ike ahụ niile o mere anyị na ụmụ anyị dịkwasịkwa Babilọn nʼisi.” Ọ bụ ihe ndị bi na Zayọn kwuru. Jerusalem na-ekwukwa sị, “Ka ọbara anyị dịkwa nʼisi ndị bi na Babilọn.”
JER 51:36 Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Lee, aga m ekwuchitere gị ọnụ gị, bọtakwara gị ọbọ. Aga m emekwa ka osimiri taa, meekwa ka isi iyi mmiri niile taakwa.
JER 51:37 Babilọn ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, ọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa, bụrụkwa ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ebe mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa.
JER 51:38 Ndị ya niile na-agbọ ụja dịka ụmụ ọdụm, ha na-emekwa ụzụ dịka ụmụ ọdụm na-aṅụ ara.
JER 51:39 Ma nʼoge ahụ a kpaliri ha, aga m edo oriri nʼihu ha. Aga m eme ka ha ṅụbiga mmanya oke, si otu a mee ka ha jiri oke ịchị ọchị tie mkpu ọṅụ. Nʼikpeazụ, ha ga-arahụ ụra ebighị ebi, nke ha na-agaghị esite na ya bilie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 51:40 “Aga m akpụdata ha, dịka ụmụ atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka ebule na mkpi.
JER 51:41 “Lee ka a ga-esi dọta Sheshak nʼagha, jichie ihe ụwa niile ji anya isi nʼagha. Lee ka Babilọn ga-esi ghọọ ihe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mba niile!
JER 51:42 Osimiri ga-eri Babilọn, mmali elu nke mmiri ya ga-ekpuchi ya.
JER 51:43 Obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu, ọ ga-abụ ebe kpọrọ nkụ, na ala ọzara, ọ ga-aghọ ala onye ọbụla na-agaghị ebi nʼime ya, nke mmadụ ọbụla na-agaghị esi nʼetiti ya gafee.
JER 51:44 Aga m ata Bel dị na Babilọn ahụhụ, mee ya ka ọ gbọpụta ihe ndị ahụ o loro. Mba dị iche iche agakwaghị agakwurukwa ya ọzọ. Mgbidi Babilọn ga-adakwa.
JER 51:45 “Sinụ nʼime ya pụta, unu ndị m! Gbapụnụ ọsọ nʼihi ndụ unu. Gbapụnụ ọsọ site nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.
JER 51:46 Unu adala mba, unu atụkwala ụjọ, mgbe unu nụrụ akụkọ dị iche iche nʼala ahụ. Nʼihi na otu ụdị akụkọ ka a ga-anụ nʼafọ a, akụkọ ọzọ dị iche ka a ga-anụkwa nʼafọ nke ọzọ. A ga-anụ akụkọ iwusi ọbara nʼala ahụ, nụkwa akụkọ onye ọchịchị nke na-ebuso onye ọchịchị ọzọ agha.
JER 51:47 Nʼihi na oge ahụ aghaghị ịbịa mgbe m ga-ata arụsị niile dị na Babilọn ahụhụ. A ga-eme ka ihere mee ala ahụ niile. Ndị ya niile e gburu egbu ga-ada, tọgbọrọkwa nʼime ya,
JER 51:48 mgbe ahụ, eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha ga-eti mkpu ọṅụ nʼihi ihe dakwasịrị Babilọn. Ndị ga-ebuso ya agha ga-esitekwa nʼugwu bịa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
JER 51:49 “Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu, dịka ndị niile e gburu nʼụwa si daa site nʼaka ndị Babilọn.
JER 51:50 Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ, wezuganụ onwe unu, unu eguzokwala. Chetanụ Onyenwe anyị nʼala ahụ dị anya, na-echetakwa Jerusalem.”
JER 51:51 “Ihere emeela anyị, nʼihi na a kparịala anyị. Ihere ekpuchiekwala ihu anyị, nʼihi na ndị mba ọzọ abatala nʼebe nsọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị.”
JER 51:52 “Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata arụsị ya niile ahụhụ. Ndị e merụrụ ahụ ga-asụkwa ude nʼala ahụ niile.
JER 51:53 A sịkwarị na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe, ma a sịkwa na o wusie ebe dị elu nke ike ya mee ka o siwanyekwuo ike karịa, aga m ezite ndị mbibi ga-abịa megide ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
JER 51:54 “Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta, ụzụ oke ịla nʼiyi sikwa nʼala ndị Babilọn na-apụta.
JER 51:55 Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi. Ọ ga-emekwa ka oke ụzụ ha kwụsị. Mbigbọ nke ndị iro ga-adịkwa ka mbigbọ nke ọtụtụ mmiri, mkpọtụ nke olu ha ga-ada ụda dị ukwuu.
JER 51:56 Onye mbibi ga-ebuso Babilọn agha. A ga-adọta ndị bụ dike ya nʼagha, gbajisiekwa ụta ha niile. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke onye na-akwụghachi; ọ ga-akwụghachikwa nʼuju ya.
JER 51:57 Aga m eme ka ndịisi ọchịchị ya niile, na ndị maara ihe ha ṅụbiga mmanya oke; aga m emekwa ndị ha na-achị achị, na ndịisi ha, na ndị ha bụ dike nʼagha otu ihe ahụ. Ha ga-arahụ ụra ruo mgbe ebighị ebi. Ha agaghị esitekwa nʼụra ahụ bilie ọzọ.” Ọ bụ ihe Eze ahụ kwubiri, bụ onye ahụ aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
JER 51:58 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “A ga-akwada mgbidi Babilọn nke sara mbara, mee ka ọ daruo ala, a ga-eji ọkụ sunye nʼọnụ ụzọ ama ya niile dị elu. Ndị dị iche iche na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ndọgbu nʼọrụ nke mba niile dị iche iche ga-abụ nkụ a na-akwanye nʼọkụ.”
JER 51:59 Ndị a bụ ozi Jeremaya, bụ onye amụma ziri onyeisi ozi aha ya bụ Seraya nwa Neraya, nwa Mahseia, mgbe o so Zedekaya eze Juda gaa Babilọn. E ziri ya ozi a nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Zedekaya.
JER 51:60 Jeremaya depụtara nʼakwụkwọ ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ niile ga-abịakwasị Babilọn, ya bụ ihe niile e dere banyere Babilọn.
JER 51:61 Ọ sịrị Seraya, “Mgbe i ruru Babilọn, lezie anya hụ na ị gụpụtara okwu ndị a niile ebe ndị mmadụ ga-anụ ya.
JER 51:62 Emesịa, ị ga-ekwukwa sị, ‘Onyenwe anyị, gị onwe gị ekwuola na i ga-ebibi ebe a, ma mmadụ maọbụ anụmanụ agaghị ebikwa nʼime ya. I kwuokwala na ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.’
JER 51:63 Mgbe ị gụsịrị ihe dị nʼakwụkwọ a, kegide ya nkume, tụnye ya nʼetiti iyi ukwu Yufretis.
JER 51:64 Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka Babilọn ga-esi mikpuo. Ọ gaghị ebilikwa ọzọ, nʼihi ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ya. Ndị ya ga-adakwa.’ ” Ebe a ka okwu Jeremaya niile gwụrụ.
JER 52:1 Zedekaya gbara iri afọ abụọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị dị ka eze na Jerusalem afọ iri na otu. Aha nne ya bụ Hamutal nwa Jeremaya, onye Libna.
JER 52:2 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jehoiakim mere.
JER 52:3 Ọ bụ nʼihi iwe Onyenwe anyị ka ihe ndị a niile ji bịakwasị Jerusalem na Juda. Nʼikpeazụ, o sitere nʼihu ya chụpụ ha. Nʼoge a, Zedekaya nupuru isi nʼokpuru eze Babilọn.
JER 52:4 Nʼihi ya, nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya, nʼụbọchị nke iri nʼọnwa nke iri, nke afọ ahụ, Nebukadneza, eze Babilọn, duuru usuu ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha. Ha mara ụlọ ikwu ndị agha nʼazụ obodo ahụ, wuokwa mgbidi nnọchibido gburugburu obodo ahụ.
JER 52:5 Anọchibidoro obodo a nʼagha ruo nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Zedekaya.
JER 52:6 Nʼabalị nke itoolu, nke ọnwa anọ nʼafọ ahụ, oke ụnwụ siri ike dị nʼobodo ahụ ruo na ọ dịkwaghị nri dị nke ndị mmadụ ga-eri.
JER 52:7 Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Babilọn nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba.
JER 52:8 Ma usuu ndị agha Babilọn chụsoro Zedekaya bụ eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya,
JER 52:9 e jide ya. Ha kpụgara ya eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe a nọ maa ya ikpe.
JER 52:10 Na Ribla ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile, nʼihu ya, o gbukwara ndịisi ọchịchị Juda niile.
JER 52:11 Ọ ghụpụrụ anya Zedekaya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpụrụ ya gaa Babilọn, ebe o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ya.
JER 52:12 Nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke ise, nke afọ iri na itoolu, nke ọchịchị Nebukadneza eze Babilọn, Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze, onye na-ejere eze Babilọn ozi, bịarutere Jerusalem.
JER 52:13 O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ.
JER 52:14 Usuu ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze ahụ, kwaturu mgbidi ahụ niile gbara Jerusalem gburugburu.
JER 52:15 Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buru ụfọdụ nʼime ndị dakarịsịrị nʼogbenye na ndị fọdụrụ nʼime obodo ahụ, ha na ndị ǹka niile fọdụrụ, na ndị ahụ ji aka ha gbakwuru eze Babilọn, bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ.
JER 52:16 Ma Nebuzaradan, hapụrụ ndị ahụ bụ nnọọ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ka ha na-elekọta ubi vaịnị niile a gbara ogige na ala ubi niile.
JER 52:17 Ma ndị Babilọn tipịara ogidi bronz niile, ha na ihe ndọkwasị niile na Oke osimiri bronz ndị ahụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, buru bronz ahụ niile bulaa Babilọn.
JER 52:18 Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri niile, na ngaji ukwu niile, na ihe bronz niile, bụ nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ.
JER 52:19 Ọchịagha ndị nche eze ahụ sikwa nʼụlọnsọ ahụ chịrị ihe ndị a: efere ukwu niile, ihe ịgụnye ọkụ niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ite niile, ihe ịdọkwasị oriọna niile, ngaji ukwu niile na iko e ji enye onyinye ihe ọṅụṅụ, ya bụ ihe ndị ahụ niile e ji ọlaedo a nụchara anụcha maọbụ ọlaọcha kpụọ.
JER 52:20 O burukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ehi iri na abụọ e ji bronz kpụọ, bụ nke dị nʼokpuru ya, na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha karịrị ihe a ga-eji ihe ọtụtụ tụọ.
JER 52:21 Ị dị elu nke otu nʼime ogidi abụọ ndị a bụ mita asatọ na ụma nʼọtụtụ. Ị dị gburugburu ya bụkwa mita ise na ụma anọ, nke ọbụla nʼime ha bụ mkpịsịaka anọ. Oghere dịkwa nʼime ha.
JER 52:22 Isi bronz nke e kpụkwasịrị nʼotu ogidi dị mita abụọ na ụma atọ nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya.
JER 52:23 Pomegranet ndị ahụ dị iri itoolu na isii, ọ bụkwa nʼakụkụ ọbụla ka ọ dị. Ọnụọgụgụ pomegranet niile dị nʼelu ihe ahụ a kpụrụ akpụ dị otu narị.
JER 52:24 Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata dịka ndị mkpọrọ.
JER 52:25 O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom asaa na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii bụ ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ.
JER 52:26 Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile, dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla.
JER 52:27 Nʼebe ahụ na Ribla, dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile. Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ.
JER 52:28 Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ahụ Nebukadneza mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ. Nʼafọ nke asaa nke ọchịchị ya, puku atọ ndị Juu na iri abụọ na atọ, 3,023.
JER 52:29 Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadneza, ka o mere ka narị mmadụ asatọ na iri atọ na abụọ, 832 si na Jerusalem gaa biri nʼala ọzọ.
JER 52:30 Nʼafọ nke iri abụọ na atọ, Nebuzaradan, onyeisi ndị nche alaeze Babilọn bulara ndị dị narị ndị Juu asaa na iri anọ na ise, 745 ka ha ga biri nʼala ọzọ. Ọnụọgụgụ ha niile dị puku anọ na narị isii, 4,600.
JER 52:31 Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn. Mgbe ahụ, o mere ka Jehoiakin eze Juda, si nʼụlọ mkpọrọ pụta, nwere onwe ya. O mere nke a nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa iri na abụọ.
JER 52:32 Ọ gwara ya okwu ọma, nyekwa ya ọnọdụ ugwu dị elu karịa ọnọdụ ndị eze ndị ọzọ niile ha na ya nọ na Babilọn.
JER 52:33 Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri.
JER 52:34 Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ, ruokwa nʼụbọchị ọnwụ ya.
LAM 1:1 Lee ka obodo ahụ nke ndị ya dị ọtụtụ si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu! Lee ka o si ghọọ nwanyị di ya nwụrụ, bụ obodo ahụ a maara aha ya nʼetiti mba niile. Lee ka onye naara abụ eze nwanyị nʼetiti ala niile a na-achị achị si ghọọ ohu.
LAM 1:2 Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị, anya mmiri na-asọdakwa na nti ya, nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya, ọ dịghị onye na-akasị ya obi. Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya; ha niile aghọọla ndị iro ya.
LAM 1:3 Juda ejeela biri nʼala ọzọ, mgbe o siri nʼọnọdụ mweda nʼala na ndọgbu nʼọrụ pụta. Ọ na-ebi nʼetiti mba dị iche iche, ma ọ chọtaghị ebe izuike ọbụla. Nʼetiti nhụju anya ya ndị niile na-achụ ya ọsọ achụkwutela ya.
LAM 1:4 Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ, nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka. Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu, ndị nchụaja ya na-asụ ude, ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute, ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu.
LAM 1:5 Ndị iro ya aghọọla ndị na-achị ya; ndị iro ya nọ nʼahụ udo. Nʼihi na Onyenwe anyị emekpaala ya ahụ, nʼihi ịba ụba nke njehie ya niile. E burula ụmụntakịrị ya bulaa mba ọzọ, dịka ndị a dọtara nʼagha.
LAM 1:6 Ịma mma niile esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ. Ụmụ eze ya dị ka ele nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri. Nʼihi adịghị ike ha, ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga.
LAM 1:7 Nʼụbọchị ndị ahụ niile e wedara ya nʼala, Jerusalem echetala akụ ndị ahụ niile bụ nke ya na mgbe ochie. Jerusalem echetala ha nʼụbọchị ndị ahụ niile ọ na-awagharị. Mgbe ndị ya dabara nʼaka ndị iro ya, o nweghị onye inyeaka ha hụrụ. Nʼoge ahụ, ndị iro ya hụrụ ọnọdụ ya, chịa ya ọchị.
LAM 1:8 Jerusalem emehiela nke ukwu, nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ. Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya, nʼihi na ha ahụla ọtọ ya. Ya onwe ya kwa na-asụ ude, ma chigharịakwa azụ.
LAM 1:9 Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya. Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu. Lee ka o si daa, dasie ike, ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi. “Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile. Lee ka ndị iro si merie m.”
LAM 1:10 Onye iro agbasaala aka ya chịkọtaa akụ ya niile. O ji anya ya hụ ka mba ndị ọzọ dị iche iche si bata ebe nsọ ya. Ndị ahụ na-ekwesighị ịbata bụ ndị batara nʼebe nzukọ gị.
LAM 1:11 Ndị ya niile na-asụ ude mgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri. Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri, ime ka ha nwee ike dịrị ndụ. “Onyenwe anyị, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile, nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị.”
LAM 1:12 “Ọ bụ na ọ dịghị emetụ unu nʼobi, unu ndị niile na-esi ebe a na-agafe? Legharịanụ anya unu ka unu hụrụ. O nwere ahụhụ dịka ahụhụ m, nke e mere ka ọ bịakwasị m, bụ nke Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị m, nʼụbọchị ọ na-ewe iwe ya dị ọkụ?
LAM 1:13 “O si nʼelu zite ọkụ, e, o zitere ọkụ nke na-ere nʼime ọkpụkpụ m. Ọ gbasara ụgbụ nʼebe ụkwụ m ga-esi gafee, meekwa ka m laghachi azụ. O mere ka m bụrụ ihe tọgbọrọ nʼefu, onye na-ada mba ogologo ụbọchị niile.
LAM 1:14 “Ọ na-eleru anya na mmehie m niile; jiri aka ya na-akpa ha dịka ụdọ. A nyakwasịla ya nʼolu m. Onyenwe anyị emeela ka ike gwụsịa m. O werela m nyefee nʼaka ndị ahụ m na-apụghị iguzogide.
LAM 1:15 “Onyenwe anyị ajụla ndị niile bụ dike nʼagha nọ nʼetiti m. Ọ kpọkuola usuu ndị agha ka ha bịa buo agha megide m, ka ha bịa gwepịa ụmụ okorobịa m niile. Nʼebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị ya ka Onyenwe anyị zọchara ada Juda na-amaghị nwoke.
LAM 1:16 “Ọ bụ nke a mere m ji akwa akwa. Ọ bụ ya mekwara anya mmiri ji ju m anya. O nweghị onye nkasiobi ọbụla nọ m nso; o nwekwaghị onye ga-akpọghachi mkpụrụobi m. Ụmụ m atọgbọla nʼefu, nʼihi na onye iro emeriela.”
LAM 1:17 Lee ka Zayọn si gbasapụ aka ya ma o nweghị onye nkasiobi o nwere. Onyenwe anyị enyela iwu banyere Jekọb na ndị agbataobi ya ga-aghọ ndị iro ya. Jerusalem aghọkwaala ihe rụrụ arụ nʼetiti ha.
LAM 1:18 “Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya. Geenụ ntị unu ndị niile, leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m. A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha buru ha jee mba ọzọ.
LAM 1:19 “Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma, ma ha ghọgburu m. Ndị nchụaja m na ndị okenye m nwụrụ nʼime obodo mgbe ha nọ na-achọta nri ha ga-eji debe onwe ha ndụ.
LAM 1:20 “Lee, Onyenwe anyị, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị. Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ, obi m kwa enweghị izuike nʼime m nʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ. Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa. Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya.
LAM 1:21 “Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m, ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi. Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m, ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m. Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa, nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị.
LAM 1:22 “Kwere ka ihe ọjọọ niile ha na-eme bịa nʼihu gị. Mesokwa ha mmeso dịka i si mesoo m nʼihi mmehie niile nke m. Nʼihi na ịsụ ude m dị ọtụtụ, ana m adakwa mba nʼobi m.”
LAM 2:1 Lee ka Onyenwe anyị si jiri igwe ojii nke iwe ya kpuchie ada Zayọn! O sitela nʼeluigwe tụda ịma mma Izrel nʼala, o chetakwaghị ebe mgbakwasị ụkwụ ya, nʼụbọchị iwe ya.
LAM 2:2 Onyenwe anyị elodala ebe obibi niile nke Jekọb; na-enweghịkwa ọmịiko nʼebe ọ nọ. O sitela nʼoke iwe ya dọdasịa ebe niile e wusiri ike nke ada Juda. Ọ wedala alaeze ya na ndị ụmụ eze ya nʼala, mee ka ha gharakwa ị nwee nsọpụrụ.
LAM 2:3 O sitela nʼoke iwe ya bipụ ike niile Izrel nwere. O seghachiri aka nri ya, mgbe ndị iro ha na-abịa nso. O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb; si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya.
LAM 2:4 O kweela ụta ya, jide ya nʼaka nri ya, dịka onye iro. Dịka onye iro kwa o gbuola ndị ahụ niile mara mma ile anya; ọ wụpụla iwe ya, dịka ọ bụ ọkụ, nʼelu ụlọ ada Zayọn.
LAM 2:5 Onyenwe anyị dị ka onye iro, o lomichaala Izrel. O lomichaala ụlọeze ya niile, bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike. O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa mụbaara ada Juda.
LAM 2:6 O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige; o bibiela ebe nzukọ ya niile. Onyenwe anyị emeela ka Zayọn chezọọ ime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ. Site nʼoke iwe ya, ọ jụla eze na onye nchụaja.
LAM 2:7 Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya gbakụta ebe nsọ ya azụ. O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya nyefee nʼaka onye iro; ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ Onyenwe anyị dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka.
LAM 2:8 Onyenwe anyị ekpebiela ibibi mgbidi gbara ada Zayọn gburugburu. O setịpụrụ ihe ọtụtụ; o sepụkwaghị aka ya na ibibi ya. O mere ka mkputamkpu aja na mgbidi ruo ụjụ, meekwa ka ha richapụsịa.
LAM 2:9 Ọnụ ụzọ ama ya niile emikpuola nʼala; ọ gbajiela mkpọrọ niile e ji akpọchi ha, laakwa ha nʼiyi. A dọtala eze ya na ụmụ eze ya nʼagha, buru ha jee mba ọzọ. Iwu adịghịkwa, otu a, ndị amụma ya enwekwaghị ike ịhụ ọhụ site nʼebe Onyenwe anyị nọ.
LAM 2:10 Ndị okenye ada Zayọn nọ ọdụ nʼala, dere duu. Ha ekpokwasịla aja nʼisi ha; ha eyikwasịkwala onwe ha uwe mkpe. Ụmụ agbọghọ Jerusalem na-amaghị nwoke ehulatala isi ha nʼala.
LAM 2:11 Ike agwụla anya m nʼihi ịkwa akwa, ime ime ahụ m na-anụ ọkụ. Obi m dị ka ihe a wụpụrụ nʼala, nʼihi na e bibiela ndị m, nʼihi na ụmụntakịrị na ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-ada mba nʼokporoụzọ nke obodo.
LAM 2:12 Ha na-ebere nne ha akwa na-asị, “Olee ebe ọka na mmanya dị?” Mgbe ha na-ada mba dịka ndị e merụrụ ahụ nʼokporoụzọ obodo, mgbe ọnwụ ji nwayọọ na-eripịasị ndụ ha nʼaka nne ha ku ha.
LAM 2:13 Gịnị ka m nwere ike ikwu banyere gị? Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị, gị ada Jerusalem? Gịnị ka m ga-asị na i yiri, nke ga-enyere m aka ịmata otu m ga-esi kasịe gị obi, gị ada Zayọn na-amaghị nwoke? Ọnya dị gị nʼahụ miri emi, dịka ịdị omimi nke osimiri. Onye pụrụ ịgwọ gị?
LAM 2:14 Ọhụ niile ndị amụma gị hụrụ bụ ọhụ ụgha na ọhụ na-enweghị isi. Ha ekpugheghị mmehie gị, igbochi ndọta nʼagha nke a dọtara gị. Kama ihe ha hụtaara gị bụ ihe ụgha na nduhie.
LAM 2:15 Ndị niile si nʼebe ị nọ na-agafe na-akụrụ gị aka ha; ha na-efufe isi ha, jirikwa ada Jerusalem na-eme ihe ọchị. Ha na-ajụ ajụjụ na-asị, “Nke a ọ bụ obodo ahụ a na-akpọ ebe mabigara mma oke, ọṅụ nke ụwa niile?”
LAM 2:16 Ndị iro gị niile na-emeghepụ ọnụ ha megide gị; ha na-achị gị ọchị, na-atara gị ikekere eze. Ha na-ekwu na-asị, “Anyị eloola ya. Nke a bụ ụbọchị ahụ anyị na-ele anya ya. Anyị adịrịla ndụ hụ ya.”
LAM 2:17 Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime. O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime site nʼoge gara aga. Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla. O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị; o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị.
LAM 2:18 Obi ndị mmadụ na-etiku Onyenwe anyị. Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn, ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri ehihie na abalị niile, enyekwala onwe gị izuike, enyekwala anya gị izuike.
LAM 2:19 Bilie, kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị. Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị dịka ọ bụ mmiri. Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị nʼihi ụmụntakịrị ndị a, ndị na-ada nʼihi agụụ nʼisi okporoụzọ niile.
LAM 2:20 “Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị. Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso? O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha, bụ ụmụ nke ha mụrụ? O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị?
LAM 2:21 “Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe, nʼuzuzu nke okporoụzọ. E jirila mma agha gbuo ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m. I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị; i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha.
LAM 2:22 “Dịka i si akpọ oku ka a bịa nʼụbọchị oriri, otu a ka i si kpọkọta ihe egwu niile ka ha bịakwasị m nʼakụkụ niile. Nʼụbọchị nke iwe Onyenwe anyị ọ dịghị onye gbapụrụ ọsọ, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ndụ; ndị m lekọtara, zụlitekwa ka ndị iro m lara nʼiyi.”
LAM 3:1 Abụ m onye hụrụla ahụhụ site na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe Onyenwe anyị.
LAM 3:2 O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa nʼọchịchịrị kama nʼìhè.
LAM 3:3 Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m, mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile.
LAM 3:4 O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ, ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ.
LAM 3:5 O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu.
LAM 3:6 O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga.
LAM 3:7 Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.
LAM 3:8 Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka.
LAM 3:9 O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile, o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ.
LAM 3:10 Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche, na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya,
LAM 3:11 o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ, hapụ m na-enweghị onye inyeaka.
LAM 3:12 Ọ dọọla ụta ya mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata.
LAM 3:13 O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi.
LAM 3:14 Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile.
LAM 3:15 O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.
LAM 3:16 O meela ka m jiri okwute tajisie eze m, o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m.
LAM 3:17 Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.
LAM 3:18 Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.”
LAM 3:19 Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu.
LAM 3:20 Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m.
LAM 3:21 Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya.
LAM 3:22 Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
LAM 3:23 Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
LAM 3:24 Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”
LAM 3:25 Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
LAM 3:26 Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
LAM 3:27 Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya mgbe ọ bụ okorobịa.
LAM 3:28 Ya nọrọkwa duu naanị ya, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị bokwasịrị ya ibu ahụ.
LAM 3:29 Ya tinye ihu ya nʼaja, nʼihi na olileanya nwere ike dịrị.
LAM 3:30 Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya, ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ.
LAM 3:31 Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo mgbe ebighị ebi.
LAM 3:32 Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya, nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu.
LAM 3:33 Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ, maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ.
LAM 3:34 Iji ụkwụ zọgbuo ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ
LAM 3:35 ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka nʼihu Onye kachasị ihe niile elu,
LAM 3:36 ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ. Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a?
LAM 3:37 Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ?
LAM 3:38 Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu ka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa?
LAM 3:39 Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu mgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya?
LAM 3:40 Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya. Ka anyị lọghachikwutenụ Onyenwe anyị.
LAM 3:41 Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye Chineke nọ nʼeluigwe, sị:
LAM 3:42 “Anyị emehiela, nupu isi, ma ị gbagharabeghị.
LAM 3:43 “I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ. I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere.
LAM 3:44 I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị ka ekpere anyị ghara irute gị.
LAM 3:45 I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ nʼetiti mba niile.
LAM 3:46 “Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ ha megide anyị.
LAM 3:47 Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche, na mbibi na ịla nʼiyi.”
LAM 3:48 Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta nʼihi ndị m a lara nʼiyi.
LAM 3:49 Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta na-akwụsịghị akwụsị,
LAM 3:50 tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe ledata anya ma hụ.
LAM 3:51 Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu, nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m.
LAM 3:52 Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla, na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ.
LAM 3:53 Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu site nʼịtụ m nkume.
LAM 3:54 Mmiri kpuchiri m isi, echere m na-efuola m.
LAM 3:55 Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị, gị Onyenwe anyị.
LAM 3:56 Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị. Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.”
LAM 3:57 Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị. Ị sịrị, “Atụla egwu.”
LAM 3:58 Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m, gị gbapụtara ndụ m.
LAM 3:59 Onyenwe anyị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m. Kpechitere m ọnụ m.
LAM 3:60 Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile na nzube niile ha na-ezube megide m.
LAM 3:61 Onyenwe anyị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m na nzube niile ha na-ezube megide m.
LAM 3:62 Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m megide m ogologo ụbọchị niile.
LAM 3:63 Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala. Ha ji abụ na-akọcha m.
LAM 3:64 Onyenwe anyị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha, nʼihi ihe niile aka ha rụpụtara.
LAM 3:65 Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha. Meekwa ka ịbụ ọnụ gị dịkwasị ha.
LAM 3:66 Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị, ka ha ghara ịdịkwa nʼokpuru eluigwe nke Onyenwe anyị ọzọ.
LAM 4:1 Lee ka ọlaedo si chuo echu. Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma. Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile.
LAM 4:2 Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa, ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha, si dịrị ugbu a dịka ite aja nke ọkpụ ite kpụrụ.
LAM 4:3 Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha azụ ụmụ ha, ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere; ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara.
LAM 4:4 Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ. Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri, ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ.
LAM 4:5 Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ. Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.
LAM 4:6 Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm. Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya. Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka.
LAM 4:7 Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe, ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi. Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa; ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa.
LAM 4:8 Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi. A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi. Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha; ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ.
LAM 4:9 Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ, ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi.
LAM 4:10 Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere ji gbuo ụmụ ha, sie ha. Ụmụ ha ghọọrọ ha nri nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi.
LAM 4:11 Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè; ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ. O sunyela ọkụ na Zayọn, nke rechapụrụ ntọala ya niile.
LAM 4:12 Ndị eze nke ụwa ekwetaghị; otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị na ndị iro nwere ike si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem.
LAM 4:13 Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya, na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya, ndị wụsiri ọbara ndị ezi omume nọ nʼetiti ya.
LAM 4:14 Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile, dịka ndị kpuru ìsì. Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha. O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka.
LAM 4:15 Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ! Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!” Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị, ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha, “O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.”
LAM 4:16 Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha. Ọ gaghị agụnyekwa ha. Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja, ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara.
LAM 4:17 Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị, ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka. Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị.
LAM 4:18 Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere, nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị. Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị, tupu ọgwụgwụ anyị eruo.
LAM 4:19 Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike karịa ugo na-efe na mbara eluigwe. Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile, nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị.
LAM 4:20 Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ, ka ha jidere nʼọnya ha. Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya, nʼetiti mba dị iche iche.
LAM 4:21 Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm, onye nke bi nʼala Uz. Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ. Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ.
LAM 4:22 Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala; Ọ gaghị emekwa ka i jee biri ogologo oge na mba ọzọ. Kama, ọ ga-ata gị ahụhụ nʼihi mmehie gị, gị, ada Edọm, kpugheekwa ajọ omume gị niile.
LAM 5:1 Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị; leekwa anya ka ị hụrụ ọnọdụ ihere anyị.
LAM 5:2 E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka, werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ.
LAM 5:3 Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna. Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ.
LAM 5:4 Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ. Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ.
LAM 5:5 Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ, ike agwụla anyị, enyeghị anyị izuike.
LAM 5:6 Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼaka nʼihi inweta nri ga-ezuru anyị.
LAM 5:7 Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla. Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha.
LAM 5:8 Ndị bụ ohu na-achị anyị. Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha.
LAM 5:9 Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri, nʼihi mma agha nke dị nʼọzara.
LAM 5:10 Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ, na-amakwa jijiji nʼihi agụụ.
LAM 5:11 Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn, ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda.
LAM 5:12 Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu; a dịghị enyekwa ndị okenye nsọpụrụ.
LAM 5:13 Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri, ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ.
LAM 5:14 Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama, ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha.
LAM 5:15 Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị; ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ.
LAM 5:16 Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela.
LAM 5:17 Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba, nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị.
LAM 5:18 Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu, nke ghọrọ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị.
LAM 5:19 Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
LAM 5:20 Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam? Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile?
LAM 5:21 Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa; gbanwee ụbọchị anyị ka ọ dị ọhụrụ dịka na mgbe ochie,
LAM 5:22 ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpam na-eweso anyị iwe nke ukwu.
EZE 1:1 O ruo nʼafọ nke iri atọ, nʼọnwa nke anọ, nʼụbọchị nke ise ya, mgbe mụ onwe m na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri na mba ọzọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, na e meghere eluigwe mee ka m hụ ọhụ dị iche iche site nʼaka Chineke.
EZE 1:2 Nʼụbọchị nke ise nʼọnwa ahụ, ọ bụ nʼafọ nke ise mgbe a dọkpụụrụ eze Jehoiakin jee mba ọzọ,
EZE 1:3 okwu Onyenwe anyị ruru Izikiel onye nchụaja nwa Buzi ntị, mgbe ọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, nke dị nʼala ndị Kaldịa. Nʼebe ahụ kwa ka aka Onyenwe anyị nọ dịkwasị ya nʼahụ.
EZE 1:4 Elere m anya hụ oke ifufe nke si nʼugwu na-abịa, ahụkwara m oke igwe ojii na amụma nke na-egbuke egbuke; ìhè nke na-enwu nnọọ vaa gbara ya gburugburu. Etiti ọkụ ahụ nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amụke.
EZE 1:5 Ihe e kere eke anọ dị ndụ, nke yiri mmadụ nʼụdịdị ha, nọkwa nʼetiti oke ihe ahụ.
EZE 1:6 Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ, na nku anọ.
EZE 1:7 Ụkwụ ha guzoro kwem; ọbụ ụkwụ ha dịka nke nwa ehi, na-amụkekwa dịka bronz e hichara nke ọma.
EZE 1:8 Nʼokpuru nku ha, ha nwere aka yiri aka mmadụ nʼakụkụ anọ ha niile. Otu a ka ihu ha na nku anọ dị.
EZE 1:9 Nku ha na-emetụ na nke ibe ha. Mgbe ha na-efe, ha na-eche ihu ha nʼotu ụzọ, ha adịghị agha anya ha nʼazụ mgbe ha na-aga.
EZE 1:10 Maka oyiyi ihu ha: Ha anọ nwere ihu mmadụ, nʼakụkụ aka nri ha nwere ihu ọdụm, nʼakụkụ aka ekpe ha bụ ihu ehi, onye ọbụla nwekwara ihu ugo.
EZE 1:11 Otu ahụ ka ihu ha niile dị. Ha gbasara nku ha nʼelu, nke ọbụla nwere nku abụọ, otu nʼime nku ndị a na-emetụ nku nke ibe ya, ebe abụọ kpuchiri ahụ ha.
EZE 1:12 Ha niile gawara nʼihu. Ebe ọbụla mmụọ ahụ gara ka ha na-aga, na-eleghị anya nʼazụ.
EZE 1:13 Nʼetiti ihe ndị a dị ndụ, e nwere ihe dịka icheku ọkụ na-enwu enwu, dịkwa ka ọwa na-enwu ọkụ. Ọkụ na-esi nʼetiti ihe ndị ahụ dị ndụ na-aga ihu na azụ, ọkụ ahụ nwupụrụ enwupụ, amụma eluigwe sikwa na ya egbupụta.
EZE 1:14 Ihe ndị ahụ dị ndụ na-efegharị nʼebe a, na-efegharịkwa nʼebe nke ọzọ, dịka mgbe amụma na-egbu.
EZE 1:15 Mgbe m na-ele ihe e kere eke dị ndụ ndị a anya, ahụrụ m ụkwụ ụgbọ agha anọ nke dị nʼala nʼokpuru ha. Onye ọbụla nwere nke ya.
EZE 1:16 Ụkwụ ụgbọala ahụ niile dị ka ihe e ji nkume na-egbu maramara a na-akpọ beril kpụọ. Nke ọbụla nʼime ha anọ yikwara ibe ya. Ha niile dịkwa ka wịịlu a kpụrụ tinye nʼetiti ụkwụ ụgbọala buru ibu.
EZE 1:17 Mgbe ha pụrụ, ha na-aga nʼakụkụ anọ nke ha chere ihu ha, ma ụkwụ ụgbọ agha ahụ adịghị echigharị echigharị mgbe ha na-aga.
EZE 1:18 Azụ ụkwụ ụgbọ agha ha dị elu, dịkwa egwu. Anya jupụtakwara nʼazụ ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ.
EZE 1:19 Mgbe ihe ndị a dị ndụ fepụrụ gaa nʼihu, ụkwụ ụgbọala ndị ahụ dị nʼakụkụ ha na-eso ha. Mgbe ha feliri elu, ụkwụ ndị ahụ na-esokwa.
EZE 1:20 Ebe ọbụla mmụọ ha jere, ebe ahụ ka ha na-aga, ụkwụ ụgbọ agha ahụ na-esokwa ha, nʼihi na mmụọ nke anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ.
EZE 1:21 Mgbe ha biliri, ndị ọzọ na-ebilikwa. Mgbe ha guzoro otu ebe, ndị ọzọ na-eguzokwa. Mgbe ha feliri elu, ụkwụ ụgbọala ahụ na-eso ha. Nʼihi na mmụọ anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼime ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ.
EZE 1:22 A tụsara ihe sara mbara dịka mbara eluigwe nʼelu isi ihe ndị ahụ dị ndụ. Ọ na-eyi egwu, ma na-egbukwa nweghenweghe dịka kristal.
EZE 1:23 Nʼokpuru ihe ahụ ka ha gbasapụrụ nku ha, ka ọ na-emetụ nke ibe ya. Ha niile nʼotu nʼotu nwere nku abụọ nke na-ekpuchi ahụ ya.
EZE 1:24 Mgbe ha na-aga, nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ ebili mmiri na-amagharị amagharị. Mkpọtụ ahụ dịkwa ka ịda ụda nke olu Onye pụrụ ime ihe niile, ka olu iti mkpu nke usuu ndị agha. Mgbe ọbụla ha guzoro, ha na-achịtu nku ha.
EZE 1:25 Mgbe ahụ ha kwụsịrị mechie nku ha olu sitere nʼime ihe ahụ dịka mbara eluigwe nke dị nʼelu isi ha na-abịa.
EZE 1:26 Nʼelu mbara eluigwe ahụ, o nwere ihe dịka ocheeze e ji nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ safaia wuo. Otu onye, nke ụdịdị ya dị ka nwoke, nọkwasịkwara nʼelu oche ahụ.
EZE 1:27 Site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya, ahụ onye ahụ na-egbu maramara dịka ọkụ. Site nʼụkwụ ya ruo nʼukwu ya, ọ dị ka ọkụ na-enwu enwu, ìhè nke na-enwukwa ka ọkụ gbara ya gburugburu.
EZE 1:28 Ìhè ahụ gbara ya gburugburu, nke a na-ahụ anya, dịkwa ka ìhè eke na egwurugwu, nke a na-ahụ anya nʼoge mmiri na-ezo. Otu a ka ebube Onyenwe anyị si gosi m onwe ya. Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala kpuo ihu m nʼala. Mgbe ahụ, anụrụ m olu onye na-ekwu okwu.
EZE 2:1 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, bilie ọtọ, guzo nʼụkwụ gị abụọ, nʼihi na ana m aga ịgwa gị okwu.”
EZE 2:2 Mmụọ ahụ banyere nʼime m mgbe ahụ ọ na-ekwu okwu, mee ka m guzo ọtọ nʼụkwụ m abụọ. Anụrụ m ka ọ gwara m okwu.
EZE 2:3 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ana m eziga gị ka i jekwuru ndị Izrel, ndị bụ mba na-enupu isi, ndị nupuru isi megide m. Ha na nna nna ha enupula isi megide m, ruo ọ bụladị nʼụbọchị taa.
EZE 2:4 Ndị ahụ m na-eziga gị ka i jekwuru bụ ndị isiike na ndị nnupu isi. Sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu.’
EZE 2:5 Ma ha gere gị ntị, ma ha egeghị gị ntị (ha bụ ndị na-enupu isi), ihe dị mkpa bụ na ha ga-amata na onye amụma anọọla nʼetiti ha.
EZE 2:6 Ma gị nwa nke mmadụ, atụla ha egwu. Ka ụjọ okwu si ha nʼọnụ ghara ịtụkwa gị. Atụla egwu, ọ bụladị ma a sị na ogwu na uke gbara gị gburugburu, ọ bụladị ma a sị na i bi nʼetiti ụmụ akpị. Ka ụjọ ghara ịtụ gị nʼihi okwu ọnụ ha, ekwekwala ka ha menye gị egwu, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.
EZE 2:7 Ị ghaghị izi ha ozi m ziri gị zie ha, ma ha gere ntị ma ha egeghị ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.
EZE 2:8 Ma gị, nwa nke mmadụ, gee ntị nʼihe m na-agwa gị. Enupula isi dịka ha si nupu isi. Meghee ọnụ gị taa ihe m ga-etinye gị nʼọnụ.”
EZE 2:9 Otu mgbe ahụ, elere m anya hụ aka e setịpụrụ, nke ji akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ,
EZE 2:10 nke e dekwara ihe nʼime ya, ihu na azụ ya. Aka ahụ ji ya gbasapụrụ ya mee ka m hụ ihe e dere nʼime ya. Ọ bụ okwu ịkwa akwa na iru ụjụ na ahụhụ.
EZE 3:1 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, rie ihe a m gaje inye gị. Taa akwụkwọ a a fụkọrọ afụkọ; pụọ gaa gwa ụmụ Izrel okwu.”
EZE 3:2 Ya mere, a saghere m ọnụ m, o nyere m akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ ka m rie.
EZE 3:3 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, taa akwụkwọ a niile m nyere gị, tajuo ya afọ gị.” Atara m ya. Ma mgbe m na-ata ya, ọ tọrọ m ụtọ nʼọnụ dịka a ga-asị na ọ bụ mmanụ aṅụ.
EZE 3:4 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, bilie jekwuru ụmụ Izrel gwa ha okwu m niile.
EZE 3:5 Nʼihi na-ezighị m gị ka i jekwuru mba ndị okwu ha edoghị anya na ndị a naghị aghọta asụsụ ha, kama ọ bụ ijekwuru ụlọ Izrel.
EZE 3:6 Ezikwaghị m gị ka i jekwuru mba nwere asụsụ na-edoghị anya, nke ị na-adịghị aghọta okwu ha. Nʼihi na a sị na ọ bụ ndị dị otu a ka m zigara gị ka i jekwuru, ha gaara ege gị ntị.
EZE 3:7 Ma ụlọ Izrel agaghị ekwe gee gị ntị, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị. Nʼihi na ụlọ Izrel bụ ndị obi ha siri ike, na ndị isiike.
EZE 3:8 Lee, emeela m ka ihu gị sie ike karịa nke ha, ka egedege ihu gị siekwa ike karịa nke ha.
EZE 3:9 Aga m emekwa ka egedege ihu gị dị ka nkume siri ike, sie ike karịa nkume. Nʼihi ya, atụla ha egwu; ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-enupu isi, ma atụla ihu ha egwu.”
EZE 3:10 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, gee ntị nke ọma nʼokwu ndị a niile m na-agwa gị, tinyekwa ha nʼuche gị.
EZE 3:11 Jekwuru ndị gị a dọtara nʼagha nọ na mba ọzọ, sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,’ Gwa ha ya, ma ha gere gị ntị ma ha egeghị gị ntị.”
EZE 3:12 Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ buliri m elu. Anụrụ m olu mere oke ụzụ nʼazụ m, mgbe ebube nke Onyenwe anyị sị nʼọnọdụ ya bilie.
EZE 3:13 Ọ bụ ụzụ nke nku ihe ndị ahụ dị ndụ na-eme mgbe ha na-emetụrịta nku ibe ha; ọ bụkwa ụzụ ụkwụ wịịlu ha nke dị nʼakụkụ ha.
EZE 3:14 Mmụọ ahụ buliri m, bupụ m. Ejegharịrị m nʼobi ilu na iwe nke mmụọ m, ebe aka Onyenwe anyị dịkwa ike nʼahụ m.
EZE 3:15 A bịakwutere m ndị ahụ a dọọrọ nʼagha, ha aga biri na Tel Abib nʼakụkụ osimiri Keba. Nʼebe ahụ, bụ ebe ha na-ebi, anọdụrụ m nʼetiti ha abalị asaa, nʼọnọdụ obi ilu na ọnụma.
EZE 3:16 Mgbe abalị asaa gasịrị, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,
EZE 3:17 “Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.
EZE 3:18 Mgbe m na-asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma ọ bụrụ na ị dọghị ya aka na ntị, maọbụ ị kwughị okwu ime ka ha chigharịa site nʼụzọ ọjọọ ha niile pụta nʼihi ịzọpụta ndụ ha, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.
EZE 3:19 Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị, ma ha esighị nʼajọ omume maọbụ nʼụzọ ọjọọ ha niile chigharịa, ha ga-anwụ nʼihi mmehie, ma ndụ gị ka ị zọpụtara.
EZE 3:20 “Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼụzọ ezi omume ya wezuga onwe ya bido ime ihe ọjọọ, m siere ha ọnya, ha ga-anwụ nʼihi na ị dọghị ha aka na ntị, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha. Agaghịkwa echeta ihe ọma niile ndị ha mere, ma ị ga-aza ajụjụ maka ọnwụ ha.
EZE 3:21 Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ezi omume aka na ntị ka ọ ghara ime mmehie, ha gharakwa ime mmehie, ha ga-adị ndụ nʼihi na ha nabatara ịdọ aka na ntị ahụ. Gị onwe gị azọpụtakwala ndụ gị, nʼụzọ dị otu a.”
EZE 3:22 Aka Onyenwe anyị dịgidesịrị ike nʼahụ m nʼebe ahụ. Ma ọ sịrị m, “Bilie gaa nʼebe ahụ obosara ala dị ka m gwa gị okwu nʼebe ahụ,”
EZE 3:23 Ebiliri m gaa nʼebe ahụ ala dị larịị. Ebube Onyenwe anyị guzo nʼebe ahụ dịka ebube nke m hụrụ nʼakụkụ iyi Keba. Adara m kpuo ihu m nʼala.
EZE 3:24 Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ banyere nʼime m mee ka m guzo ọtọ nʼụkwụ m abụọ. Ọ gwara m okwu sị m, “Gaa, baa nʼụlọ, mechibido onwe gị ụzọ.
EZE 3:25 Ma gị, nwa nke mmadụ, a ga-eji ụdọ kee gị ka ị ghara inwe ike ịpụ gaa nʼetiti ndị mmadụ.
EZE 3:26 Aga m eme ka ire gị rapara nʼakpo ọnụ gị, ka ị ghọọ onye ogbi, gharakwa ịbụ onye na-adọ ha aka na ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.
EZE 3:27 Ma mgbe ọbụla m ziri gị ozi, aga m atọghepụ ire gị. Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru.’ Ka onye nwere ntị nụrụ, ka onye nke na-achọghị ịnụ ghara ịnụ, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.
EZE 4:1 “Ugbu a, gị nwa nke mmadụ, were otu ọkpụrụkpụ aja, tọgbọ ya nʼihu gị. Sepụtakwa obodo Jerusalem nʼelu ya.
EZE 4:2 Seekwa ihe nnọchigide nʼagha megide ya, wuokwa ụlọ ndị agha gburugburu ya, wukọta ụlọ ikwu dị iche iche megide ya na ihe e ji akụdasị mgbidi ya niile.
EZE 4:3 Werekwa efere igwe debe nʼetiti gị na obodo ahụ dịka mgbidi e ji igwe wuo. Chee obodo ahụ ihu gị, ka ị chegide ya nke ọma nʼihi na ndị iro gbara ya gburugburu. Nke a ga-abụ ihe ama nye ndị Izrel.
EZE 4:4 “Ugbu a, dinara ala nʼakụkụ aka ekpe gị, aga m enye gị ntaramahụhụ mmehie ndị Izrel, ị ga-ata ahụhụ mmehie ha ụbọchị niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị.
EZE 4:5 Nʼihi na ana m enye gị narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọnụọgụgụ nke a na ọnụọgụgụ nke afọ ntaramahụhụ ha ga-abụ otu, ọ bụ oge ha. Otu a ka ị ga-esi buru mmehie Izrel.
EZE 4:6 “Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-edina ala nke ugboro abụọ, ma ọ ga-abụ nʼakụkụ aka nri gị, ị ga-eburu ntaramahụhụ mmehie ndị Juda. Ọ bụ iri abalị anọ, otu ụbọchị ga-anọchi anya otu afọ.
EZE 4:7 Chee ihu gị nʼebe nnọchibido Jerusalem, gbara aka nkịtị buo amụma megide ya.
EZE 4:8 Aga m eke gị eriri ahụ gị niile, ka ị ghara inwe ike tụgharịa site nʼotu akụkụ gaa nʼakụkụ nke ọzọ tutu ụbọchị nnọchigide gị ahụ niile ezuo.
EZE 4:9 “Ma gị were ọka wiiti na ọka balị, werekwa akịdị na lentil, na ọka milet na spelti. Tinyekọta ha nʼotu ite were ha meere onwe gị achịcha. Nʼụbọchị ole ahụ niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị, narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọ bụ ya ka ị ga-eri.
EZE 4:10 A ga-atụ ihe oriri gị atụ, nri nke ị ga-eri otu mgbe ga-abụ narị gram abụọ na iri gram atọ; naanị otu mgbe ka ị ga-eri nri nʼụbọchị.
EZE 4:11 A ga-ekupụtakwa mmiri ị ga-aṅụ, ị ga-aṅụ mmiri naanị otu ugboro nʼụbọchị, otu udu mmiri e kere ụzọ isii.
EZE 4:12 Ị ga-eri ya dịka ogbe achịcha ọka balị, ị ga-eghe ya nʼelu nsị mmadụ kpọrọ nkụ mgbe ndị mmadụ nọ na-ele gị anya.”
EZE 4:13 Onyenwe anyị kwuru, “Otu a ka ndị Izrel ga-esi rie nri rụrụ arụ, nʼetiti mba dị iche iche ebe m ga-achụga ha.”
EZE 4:14 Mgbe ahụ, asịrị m, “E e, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee, emerụbeghị m onwe m site na nwantakịrị m ruo ugbu a, eribeghị ihe ọbụla nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, anụ na-adịghị ọcha abatụbeghị m nʼọnụ.”
EZE 4:15 Ọ sịrị, “Ọ dị mma, aga m enye gị nsị ehi nʼọnọdụ nke mmadụ, nʼelu ya ka ị ga-akwado achịcha gị.”
EZE 4:16 Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, lee, aga m eme ka nri kọ na Jerusalem; ha ga-eji nchegbu rie nri a tụpụtara atụpụta, jirikwa egwu ṅụọ mmiri e kupụtara ekupụta.
EZE 4:17 Aga m eme ka ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ kọọ ha. Ha ga na-elerịta onwe ha anya nʼoke egwu, ha ga-anwụkwa nʼihi mmehie ha.”
EZE 5:1 “Ma gị, nwa nke mmadụ, were mma agha dị nkọ dịka agụba onye ọkpụisi, kpụchaa isi gị na afụọnụ gị; werekwa ihe e ji atụ ihe ọtụtụ tụọ agịrị isi gị, ka ụzọ ọbụla hara nʼotu.
EZE 5:2 Ị ga-ewere otu ụzọ nʼụzọ atọ, kpọọ ya ọkụ nʼetiti obodo ahụ mgbe ụbọchị nke nnọchigide ahụ zuru; ị ga-ewere otu ụzọ, jiri mma agha chabichaa ya gburugburu obodo ahụ, otu ụzọ nke ọzọ ka ị ga-efesacha nʼikuku. Nʼihi na aga m eji mma agha chụsachaa ha.
EZE 5:3 Ma ị ga-esite nʼime ya wepụta agịrị isi dị ole na ole, kedo ha nʼọnụ ọnụ uwe gị.
EZE 5:4 Ọzọkwa, site na ndị a, ị ga-ewere ụfọdụ tụnye ha nʼime ọkụ ka ha ree ọkụ, site na ha ka ọkụ ga-esi banye nʼụlọ Izrel niile.
EZE 5:5 “Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nke a bụ Jerusalem, obodo m mere ka ọ dịrị nʼetiti mba dị nʼụwa, nke mba dị iche iche gbara gburugburu.
EZE 5:6 Ma o sitela nʼajọ omume ya, nupu isi nʼiwu na ụkpụrụ m nyere, karịa mba na obodo ndị ọzọ ahụ niile gbara ya gburugburu. Ọ jụkwara idebe iwu m, jụkwa ịgbaso ụkpụrụ m.
EZE 5:7 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ị bụrụla onye nnupu isi karịa mba niile ndị gbara gị gburugburu. Ị jụkwara idebe iwu m na ịgbaso ụkpụrụ m, ọ bụghịkwa dịka iwu na atụmatụ nke mba dị iche iche nọ gị gburugburu ka ị mere.
EZE 5:8 “Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-emegide gị bụ Jerusalem, kpee gị ikpe nʼihu mba niile.
EZE 5:9 Nʼihi ihe arụ gị niile, aga m eme gị ihe m na-emebeghị mbụ, nke m agaghị emekwa ọzọ.
EZE 5:10 Nʼihi nke a, ndị bụ nna ga-eri ụmụ ha nʼetiti gị, ụmụ ga-erikwa ndị nna ha. Aga m ekpe gị ikpe mee ka ndị fọdụrụ ndụ gbasasịa nʼụwa niile.
EZE 5:11 Ya mere, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ebe ọ bụ na i jirila oyiyi ihe arụ na omume rụrụ arụ merụọ ụlọ m, aga m esite nʼebe ị nọ wezuga ịhụnanya m. Agaghị m emekwara gị ebere maọbụ hapụ ịta gị ahụhụ.
EZE 5:12 Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị bi nʼime gị ga-anwụ site nʼagụụ maọbụ na ọrịa; otu ụzọ ga-anwụ site na mma agha nke ndị iro nọ nʼazụ mgbidi gị, otu ụzọ fọdụrụ ka a ga-achụsa nʼifufe, a ga-eji mma agha ndị iro chụsasịa ha.
EZE 5:13 “Mgbe ahụ, iwe m ga-akwụsị, ọnụma m megide ha ga-adajụkwa, na nke a ka a ga-abọrọ m ọbọ. Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼekworo mgbe m mezuru ọnụma m nʼahụ ha.
EZE 5:14 “Nʼihi ya, aga m eme ka ị bụrụ ihe e bibiri ebibi, na ihe e ji eme ihe ọchị nye mba niile gbara gị gburugburu, na nʼihu ndị na-agafe nʼụzọ ahụ.
EZE 5:15 Ị ga-abụ ihe e ji eme ihe ọchị na ihe nkọcha nye mba dị iche iche gbara gị gburugburu, mgbe m ga-eji iwe na obi ọkụ na ntaramahụhụ dị egwu kpee gị ikpe, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.
EZE 5:16 Mgbe m gbara gị àkụ ọjọọ ahụ na-eweta ọnwụ na ịla nʼiyi, bụ àkụ nke oke ụnwụ, aga m agba gị ya, gbajaa gị. Aga m anọgide na-ezite ụnwụ tutu ruo mgbe e mere ka ihe oriri kọọ gị.
EZE 5:17 Aga m ezitere gị oke ụnwụ na ajọ anụ ọhịa, ha ga-agbawa gị aka nwa, ọrịa ọjọọ na ọbara ga-esi nʼetiti gị gafee; aga m eji mma agha megide gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”
EZE 6:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 6:2 “Nwa nke mmadụ, chee iru gị nʼugwu niile nke nʼIzrel, buo amụma megide ha,
EZE 6:3 sị, ‘Unu ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị nye ugwu ukwu na ugwu nta niile, na iyi mmiri niile, na ndagwurugwu niile. Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, ga-eme ka agha bịakwasị unu, aga m ebibikwa ebe dị iche iche unu na-achụ aja.
EZE 6:4 A ga-etikpọ ebe ịchụ aja unu, tipịa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Aga m atụsa ndị unu e gburu egbu nʼihu arụsị unu.
EZE 6:5 Aga m atọgbọ ozu ndị Izrel nʼihu arụsị ha. Aga m aghasakwa ọkpụkpụ unu gburugburu ebe ịchụ aja unu.
EZE 6:6 Ebe ọbụla unu bi, a ga-etikpọ obodo ndị ahụ, tipịakwa ebe ịchụ aja niile, si otu a mee ka ebe ịchụ aja unu ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu. A ga-etipịakwa arụsị unu, kụjiekwa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ihe niile unu ji aka unu mepụta ka a ga-ekpochapụkwa.
EZE 6:7 Ndị e gburu egbu ga-ada nʼetiti unu, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 6:8 “ ‘Ma aga m eme ka ụfọdụ nʼime ndị m fọdụ. Ndị ahụ fọdụrụ ga-esi nʼihu mma agha gbapụ, gbasasịa nʼala niile, na mba niile nke ụwa.
EZE 6:9 Mgbe ha nọ dịka ndị a dọtara nʼagha na mba ọzọ, ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ga-echeta m. Ha ga-echeta otu ha si jiri obi nke ịkwa iko jupụtara nʼime ya, nke si nʼebe m nọ wezuga onwe ya, na anya nke na-agbaso arụsị ha, mee ka obi jọọ m njọ. Ha ga-akpọ onwe ha asị nʼihi ihe ọjọọ ndị ahụ ha mere, ya na ọchụchụ aja rụrụ arụ ha chụrụ.
EZE 6:10 Ha ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, matakwa na mgbe m gwara ha na ihe ndị a niile gaje ịbịakwasị ha, na ọ bụghị okwu efu ka m kwuru.
EZE 6:11 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, kụkọọ ọbọ aka gị abụọ ọnụ, zọkwaa ụkwụ gị nʼala, ma tisikwaa mkpu akwa ike site nʼobi mwute, nʼihi ihe ọjọọ niile na omume rụrụ arụ ndị Izrel mere. Nʼihi na ha ga ịla nʼiyi site nʼoke ụnwụ, na site nʼagha, na site nʼọrịa na-efe efe.
EZE 6:12 Ndị nọ nʼebe dị anya ga-anwụ site nʼọrịa na-efe efe, ndị nọ nso ga-anwụ site na mma agha, ndị fọdụrụ ndụ ga-anwụ site nʼagụụ. Aga m eme ka ha nụrụ ụfụ oke iwe m.
EZE 6:13 Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe ozu ndị e gburu egbu ga-atọgbọsị nʼetiti arụsị niile, na nʼebe ịchụ aja niile, na nʼugwu nta niile, na nʼugwu ukwu niile, na nʼokpuru osisi ọbụla, na nʼokpuru osisi ook niile, ebe ha na-anọ na-esure ụda na-esi isi ụtọ nye arụsị ha.
EZE 6:14 E, aga m esetipụ aka m megide ha, mee ka ala ha laa nʼiyi, nʼebe niile ha bi, site nʼọzara ruo na Ribla. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
EZE 7:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 7:2 “Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ala Izrel: “ ‘Ọgwụgwụ! Ọgwụgwụ abịakwasịla akụkụ anọ nke ala ahụ.
EZE 7:3 Ugbu a ka ọgwụgwụ bịakwasịrị unu. Lee, aga m eme ka iwe m bịakwasị unu; aga m ekpe unu ikpe dịka omume unu si dị, aga m ata unu ahụhụ maka arụ unu niile.
EZE 7:4 Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ, agaghị m emekwara gị ebere, kama aga m ata unu ahụhụ maka omume unu na arụ niile dị nʼetiti unu. “ ‘Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
EZE 7:5 “Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Oke mbibi, oke mbibi nke a na-anụbeghị ụdị ya mbụ. Lee, ka ọ na-abịa.
EZE 7:6 Ọgwụgwụ abịala! Ọgwụgwụ abịala! Ọ kpalitela onwe ya imegide unu. Lee, ka ọ na-abịa!
EZE 7:7 Oke nsogbu abịakwasịla gị, gị onwe gị bi nʼala ahụ. Oge ahụ abịala! Ụbọchị ahụ dịkwa nso! Ọgbaaghara dị ebe niile, ọ bụghị ọṅụ dị nʼelu ugwu niile.
EZE 7:8 Ejikerela m ịwụkwasị gị ọnụma m nʼahụ mee ka oke iwe m zuo gị ahụ niile. Aga m ekpe gị ikpe dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ gị niile.
EZE 7:9 Agaghị m emere gị ebere, agakwaghị m ahapụ ịta gị ahụhụ. Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ niile nke dị nʼetiti unu. “ ‘Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-eti unu ihe ndị a.
EZE 7:10 “ ‘Lee, ụbọchị ahụ! Lee, ka ọ na-abịa! Oke nsogbu enupụtala, mkpanaka agbala okoko nganga amaala ifuru!
EZE 7:11 Ihe ike ebilitala, mkpọrọ eji ata ndị ajọ omume ahụhụ. O nweghị onye ọbụla nʼime ha nke ga-afọdụ, maọbụ igwe mmadụ maọbụ ụba ha, o nweghịkwa nke bara uru.
EZE 7:12 Mgbe ahụ abịala! Ụbọchị ahụ abịakwala nso. Ka onye na-azụ ahịa ghara ịṅụrị ọṅụ ka onye na-ere ere ghara iru ụjụ, nʼihi na ọnụma ahụ dịrị igwe mmadụ niile.
EZE 7:13 Onye rere ahịa agaghị enwetaghachi ngwa ahịa nke erere ere ọ bụladị dịka onye rere na onye zụrụ na-adị ndụ. Nʼihi na ọhụ nke a gbasara igwe mmadụ niile bụ nke a na-apụghị ịgbanwe. Nʼihi mmehie ha niile, o nweghị onye nʼime ha nke pụrụ ichebe ndụ ya.
EZE 7:14 “ ‘Ha afụọla opi ike, ha edoziela ihe niile ma o nweghị onye ga-aga ibu agha nʼihi na ọnụma m dịkwasịrị igwe mmadụ ahụ niile.
EZE 7:15 Mma agha dị nʼezi; ajọ ọrịa na-efe efe na ụnwụ dịkwa nʼime. Onye nọ nʼọhịa ga-anwụ site na mma agha, ndị nọ nʼime obodo ukwu ka ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịa.
EZE 7:16 Ma ndị gbapụrụ agbapụ ga-agbaga nọrọ nʼugwu. Ọ bụ dịka nduru nke ndagwurugwu, ha niile ga-asụ ude akwa, onye ọbụla nʼihi mmehie ha.
EZE 7:17 Aka niile ga-akụda, ikpere niile ka a ga-eji amịrị nyụdee.
EZE 7:18 Ha ga-eyikwasị akwa mkpe, oke ihe egwu ga-ekpuchi ha. Ọ bụkwa ihu niile ka ihere ga-ekpuchi, a ga-akpụchakwa isi niile.
EZE 7:19 “ ‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha. Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị enwe ike napụta ha nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị. Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha, maọbụ mee ka afọ ju ha, nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie.
EZE 7:20 Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga, ha jikwa ya mepụta arụsị rụrụ arụ ha dị iche iche. Ha ji ya metakwa oyiyi ihe arụ niile jọgburu onwe ya; ya mere, aga m eme ka ọ bụụrụ ha ihe rụrụ arụ.
EZE 7:21 Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha, nyekwa ya ndị ajọ omume nke ụwa dịka ihe nkwata ndị ga-emerụ ya.
EZE 7:22 Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m ndị ohi ga-emerụkwa ebe ahụ m kpọrọ ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-abata nʼime ya merụọkwa ya.
EZE 7:23 “ ‘Kwadoonụ ụdọ igwe. Nʼihi na ala ha jupụtara nʼigbu ọchụ na ịwụsa ọbara, obodo ahụ jupụtara nʼihe ike.
EZE 7:24 Aga m akpọta mba ndị ahụ jọgburu onwe ha ka ha bịa nwetara onwe ha ụlọ ha niile. Aga m eme ka mpako nke ndị bụ dike kwụsị, meekwa ka ebe nsọ ha niile bụrụ ebe e merụrụ emerụ.
EZE 7:25 Mgbe ihe mmekpa ahụ bịara, ha ga-achọ udo ma o nweghị nke ga-adị.
EZE 7:26 Mbibi ga-esochi mbibi, akụkọ na-enweghị isi ga-esochikwa akụkọ na-enweghị isi. Ha ga-agagharị na-achọ ọhụ site nʼaka onye amụma, ntụziaka onye nchụaja ga-akwụsị, ndụmọdụ nke ndị okenye agaghị adịkwa.
EZE 7:27 Eze ga-eru ụjụ, nwa eze ga-eyikwasị ịda mba nke obi dịka uwe, aka ga-ama ndị ala ahụ niile jijiji nʼihi egwu. Aga m emeso ha dịka omume ha si dị, aga m ekpekwa ha ikpe dịka ihe ha kwenyeere si dị. “ ‘Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
EZE 8:1 Nʼafọ nke isii, nʼọnwa nke isii, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, mgbe mụ onwe m nọdụ ala nʼụlọ m, ndị okenye Juda na-anọdụkwa ala nʼihu m, aka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ nʼebe ahụ.
EZE 8:2 Ahụrụ m oyiyi yiri mmadụ. Akụkụ oyiyi a nke dị site nʼụkwụ ya ruo nʼala ya na-acha dịka ọkụ, sitekwanụ nʼụkwụ ya rigoo, ọ na-egbu nnọọ amụma dịka nkume amba dị oke ọnụahịa.
EZE 8:3 Oyiyi a setịpụrụ ihe dịka aka mmadụ, jiri ya jide m nʼagịrị isi m. Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu nʼetiti ala na mbara eluigwe. Nʼime ọhụ nke Chineke, o buuru m jee Jerusalem, nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼugwu, nʼime ogige ya, ebe arụsị ahụ na-akpasu ekworo guzo.
EZE 8:4 Ma, lee, ebube Chineke Izrel jupụtara nʼebe ahụ, dị ka m si hụ ya na mbụ na ndagwurugwu.
EZE 8:5 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, welie anya gị lee nʼụzọ nke ugwu.” Eweliri m anya m lee nʼụzọ ugwu, ma lee, nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ebe ịchụ aja, ahụrụ m oyiyi arụsị ekworo ka o guzo nʼakụkụ ugwu ya.
EZE 8:6 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị na-ahụ ihe ha na-eme, arụ dị egwu nke ụlọ Izrel na-eme nʼebe a, ihe ndị ga-achụpụ m nʼebe dị anya site nʼebe nsọ m? Ma ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.”
EZE 8:7 O mere ka m guzo nʼọnụ ụzọ ogige ahụ, mgbe m lere anya, ahụrụ m oghere dị nʼaja ụlọ ahụ.
EZE 8:8 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ugbu a gwupuo aja ụlọ a.” Mgbe m gwupuru ya, ahụrụ m ọnụ ụzọ e si aba nʼebe ahụ.
EZE 8:9 Ọ sịrị m, “Banye nʼime ka ị hụ ihe arụ ọjọọ niile nke ha na-eme nʼebe a.”
EZE 8:10 Abanyere m hụ na ihe jupụtara nʼahụ ụlọ ahụ bụ naanị oyiyi e sere ese, nke ihe na-akpụ akpụ dịka agwọ dị iche iche, ngwere na anụmanụ rụrụ arụ dị iche iche, tinyekwara arụsị niile nke ụlọ Izrel na-efe.
EZE 8:11 Nʼihu ihe ndị a, ka iri ndị okenye asaa nke ụlọ Izrel, ha na Jaazanaya nwa Shefan guzo nʼebe ahụ. Onye ọbụla nʼime ha ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼaka ya, anwụrụ ọkụ si nʼihe nsure ọkụ ndị a na-agbagokwa elu.
EZE 8:12 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụla ihe ndị okenye ụlọ Izrel na-eme nʼọchịchịrị, onye ọbụla nʼime ụlọ ya nʼihu arụsị ya? Ma ha na-asị, ‘Onyenwe anyị adịghị ahụ anyị, O sitela nʼala anyị wezuga onwe ya.’ ”
EZE 8:13 Ọzọ, ọ sịrị m, “Ị ga-ahụkwa oke ihe arụ karịrị ndị a ha na-eme!”
EZE 8:14 O mere ka m bịakwa nʼọnụ ụzọ ahụ dị nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼebe ahụ, ahụrụ m ndị inyom nọ na-akwa akwa nʼihi Tamuz, chi ha.
EZE 8:15 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ị hụla ihe ndị a, nwa nke mmadụ? Ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.”
EZE 8:16 O mere ka m baa nʼime ogige dị nʼime ụlọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼebe ahụ, nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼagbata ebe ịchụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, ka ihe ruru iri mmadụ abụọ na ise guzo, chee ihu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-efe anyanwụ. Ha gbakụtara ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị azụ mgbe ha na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ na-akpọ isiala nye anyanwụ.
EZE 8:17 Ọ sịrị m, “Ị hụla nke a, nwa nke mmadụ? Ọ bụ ihe dị nta nye ụlọ Juda, bụ ime ihe arụ niile ndị a ha na-eme nʼebe a? Ha ga-ejikwa ihe ike mejupụta ala, siri otu a na-akpasu m iwe mgbe niile? Lee ka ha si nọgide na-akparị m, na-etinye alaka nʼimi ha.
EZE 8:18 Nʼihi ya, aga m eme ka ha nụrụ ụfụ iwe m, ọ dịkwaghị onye m ga-ahapụ. Ọ bụrụkwa na ha anọgide na-ebe akwa nʼoke olu, agaghị m aṅa ha ntị.”
EZE 9:1 Mgbe ahụ, a nụrụ m ka o ji oke olu kpọọ oku sị, “Bịanụ nso, unu bụ ndị ahọpụtara ilekọta obodo a, onye ọbụla jidekwa ngwa agha nʼaka ya.”
EZE 9:2 A hụrụ m ndị ikom isii si nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼakụkụ ebe dị elu na-apụta, nke chere ihu nʼugwu, onye ọbụla jikwa mma agha nʼaka ya. Otu onye nʼime ha yi uwe akwa ọcha, nyarakwa nwa akpa nke ihe e ji ede akwụkwọ dị nʼime ya. Ha niile batara nʼime ụlọnsọ, guzokwa nʼakụkụ ebe ịchụ aja e ji bronz wuo.
EZE 9:3 Ma ebube nke Chineke Izrel sitere nʼelu cherubim ndị ahụ, ebe ọ nọ na mbụ, bilie bịa guzokwa nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha bụ onye nya akpa ahụ nke ihe e ji ede ihe dị nʼime ya,
EZE 9:4 ọ sịrị ya, “Bilie, jegharịa nʼokporoụzọ niile nke obodo Jerusalem, kakwasị akara nʼegedege ihu ndị niile na-akwa akwa na ndị niile na-asụ ude nʼihi ihe arụ niile nke a na-eme nʼime ya.”
EZE 9:5 Anụkwara m ka ọ gwara ndị ọzọ, “Soronụ ya baa nʼime obodo, gbukwaanụ, unu emekwarala onye ọbụla ebere maọbụ ọmịiko.
EZE 9:6 Gbuonụ ha niile, ndị okenye, na ụmụ okorobịa, na ụmụ agbọghọbịa, na ndị inyom, na ụmụntakịrị. Ma unu emetụkwala onye ọbụla nwere akara ahụ nʼihu ya. Malitenụ nʼebe a, nʼime ụlọnsọ ukwu m.” Ya mere, ha malitere igbu ndị okenye ndị nọ nʼihu ụlọnsọ.
EZE 9:7 Ọ sịkwara ha, “Merụọnụ ụlọnsọ a! Werekwanụ ozu ndị unu gburu egbu tụjuo nʼime ogige ya! Gaanụ!” Ha pụrụ baa nʼime obodo, bido igbu ndị mmadụ.
EZE 9:8 Mgbe ha nọ na-egbu ndị mmadụ maọbụ naanị m fọdụrụ, adara m nʼala kpuchie ihu m, tie mkpu akwa, sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Ị ga-esite nʼoke iwe ị na-eweso Jerusalem bibie ihe niile fọdụrụ nʼIzrel?”
EZE 9:9 Ọ sịrị m, “Mmehie niile nke ụlọ Izrel na Juda dị ukwuu rie nne. Ala niile jupụtakwara nʼọbara ndị egburu, obodo jupụtakwara nʼikpe ikpe na-ezighị ezi. Nʼihi na ha na-asị, ‘Onyenwe anyị esitela nʼala anyị wezuga onwe ya. Ọ dịghị ihe Onyenwe anyị na-ahụ.’
EZE 9:10 Nʼihi ya, agaghị m ahapụ ha, agakwaghị m enwe ọmịiko nʼahụ ha. Aga m akwụghachi ha nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere.”
EZE 9:11 Mgbe ahụ, nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nya akpa nke ihe e ji ede akwụkwọ dị nʼime ya, lọghachiri sị, “Arụchaala m ọrụ i nyere m ịrụ.”
EZE 10:1 Mgbe ahụ, elere m anya hụ ocheeze ọma e ji nkume safaia wuo ka ọ pụtara ihe na mbara eluigwe, nʼelu ebe ahụ isi cherubim ndị ahụ dị.
EZE 10:2 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, “Baa nʼetiti ụkwụ ụgbọala ahụ dị nʼokpuru cherubim ndị ahụ. Site nʼetiti cherubim ndị ahụ kpojuo icheku ọkụ nke na-ere ere nʼaka gị, fesachaa ha nʼime obodo ahụ niile.” Ọ bara nʼime ka m nʼele ya anya.
EZE 10:3 Cherubim ndị ahụ na-eguzo nʼakụkụ ndịda nke ụlọnsọ ahụ mgbe nwoke ahụ banyere. Igwe ojii jupụtakwara nʼogige ime ụlọnsọ ahụ.
EZE 10:4 Mgbe ahụ, ebube Onyenwe anyị sitere nʼelu cherubim bilie, bịa guzo nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Ụlọnsọ ahụ jupụtakwara nʼigwe ojii, ihe nke ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼogige ụlọnsọ ahụ.
EZE 10:5 Ụzụ nke nku cherubim ndị ahụ na-eme dịkwa ka olu Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. A na-anụkwa ụzụ nku ndị ahụ nʼogige ụlọnsọ ahụ dị nʼezi.
EZE 10:6 Mgbe Onyenwe anyị nyere nwoke ahụ yi uwe ezi akwa ọcha iwu, sị, “Gaa nʼetiti cherubim ahụ gụta ụfọdụ icheku ọkụ dị nʼetiti wịịlu ụgbọala ahụ,” nwoke ahụ banyere guzo nʼakụkụ otu wịịlu ahụ.
EZE 10:7 Mgbe ahụ, otu nʼime ndị cherubim ahụ setịpụrụ aka ya nʼebe ọkụ ahụ dị nʼetiti ha. Ọ gụtara ụfọdụ icheku ọkụ tinye nʼaka nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha onye weere ya pụọ.
EZE 10:8 Nʼokpuru nku ndị cherubim ahụ ka a na-ahụta ihe yiri aka mmadụ.
EZE 10:9 Elere m anya hụ wịịlu anọ, nke dị nʼakụkụ cherubim ndị ahụ. Cherubim ọbụla nwere otu wịịlu nʼakụkụ ya. Wịịlu ndị a niile na-egbu maramara dịka nkume beril.
EZE 10:10 Wịịlu anọ ndị ahụ yiri onwe ha. Nke ọbụla nʼime ha dịka wịịlu a rụnyere nʼetiti wịịlu ọzọ.
EZE 10:11 Mgbe ha na-aga, ha niile na-eche ihu nʼakụkụ ọbụla nke cherubim ndị ahụ chere ihu. Wịịlu ndị a adịghị echigharị echigharị mgbe cherubim ndị a na-agagharị. Kama ebe isi cherubim ndị ahụ chere ihu ka wịịlu ndị ahụ na-aga. Ha adịghị elekwa anya nʼazụ dịka ha na-aga.
EZE 10:12 Gburugburu ha, nʼanụ ahụ ha niile, ma nʼazụ ha, ma nʼaka ha, ma na nku ha, ma na wịịlu ndị ahụ, ihe jupụtara ha bụ anya. Anya dị nʼakụkụ ha niile.
EZE 10:13 Aha m nụrụ a na-akpọ wịịlu ndị ahụ bụ, Ọgba gburugburu.
EZE 10:14 Nke ọbụla nʼime cherubim ndị a nwere ihu anọ. Ihu nke mbụ dịka ihu cherub. Nke abụọ dịka ihu mmadụ; nke atọ dịka ihu ọdụm, ma nke anọ dịka ihu ugo.
EZE 10:15 Mgbe ahụ, Cherubim ndị ahụ buliri onwe ha elu. Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ nke m hụrụ na mbụ nʼakụkụ osimiri Keba.
EZE 10:16 Mgbe cherubim ndị ahụ na-aga, wịịlu ndị ahụ dị nʼakụkụ ha na-eso ha na-aga. Mgbe ha na-achili nku ha i si nʼala bulie onwe ha elu, wịịlu ha na-anọgidekwa nʼakụkụ ha.
EZE 10:17 Mgbe cherubim ndị ahụ guzoro nʼotu ebe, wịịlu ahụ na-eguzokwa. Mgbe ha na-ebuli onwe ha elu, wịịlu ndị ahụ na-ebulikwa onwe ha elu, nʼihi na mmụọ nke ihe ahụ dị ndụ dị nʼime ha.
EZE 10:18 Emesịa, ebube nke Onyenwe anyị sitere na mbata ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ pụọ, gaa guzo nʼelu cherubim ndị ahụ.
EZE 10:19 Mgbe m nọ na-ele anya, cherubim ahụ gbasapụrụ nku ha felie, wịịlu ha niile dịkwa nʼakụkụ ha. Ha guzoro na mbata ọnụ ụzọ nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọ Onyenwe anyị, na ebube nke Chineke nke Izrel dịkwa nʼelu ha.
EZE 10:20 Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ, nke m hụrụ nʼokpuru Chineke Izrel nʼakụkụ osimiri Keba, amatara m na ha bụ cherubim.
EZE 10:21 Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ na nku anọ, na ihe yiri aka mmadụ nʼokpuru nku ha.
EZE 10:22 Ihu ha yikwara ihu ihe ndị ahụ m hụrụ nʼakụkụ osimiri Keba. Nke ọbụla na-agakwa ije nʼihu ihu na-eleghị anya nʼazụ.
EZE 11:1 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m mee ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama ụlọ Onyenwe anyị, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Nʼebe ahụ, nʼoghere nke ọnụ ụzọ ama ahụ, ahụrụ m iri mmadụ abụọ na ise. Ahụkwara m nʼetiti ha, Jaazanaya nwa Azoa na Pelataya nwa Benaya, bụ ndịisi ndị Izrel.
EZE 11:2 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị ikom na-agba izu ajọ ihe, na-enyekwa ndụmọdụ ọjọọ niile a na-enye nʼobodo a.
EZE 11:3 Ha na-asị, ‘Oge a ga-ewuzi ụlọ ndị ahụ ọ dịghị nso? Obodo a bụ ite igwe, anyị onwe anyị bụkwa anụ dị nʼime ya.’
EZE 11:4 Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma megide ha.”
EZE 11:5 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Onyenwe anyị bịakwasịrị m sị m kwuo, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: otu a ka unu na-ekwukwa, unu ndị ndu ụlọ Izrel, ma amaara m ihe unu bụ nʼuche.
EZE 11:6 Unu egbuola ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a, meekwa ka okporoụzọ ya jupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ.
EZE 11:7 “Nʼihi ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ji sị, ozu ndị ahụ niile tọgbọ nʼokporoụzọ obodo unu bụ anụ ndị ahụ unu gburu egbu, obodo a bụkwa ite. Ma aga m eme ka unu site nʼime ya pụta.
EZE 11:8 Mma agha ahụ unu na-atụ egwu ya ka m ga-eme ka ọ bịakwasị unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
EZE 11:9 Aga m esitekwa nʼetiti ya kpọpụta unu, were unu nyefee nʼaka ndị mba ọzọ, ma kpekwa unu ikpe.
EZE 11:10 Unu ga-ada site na mma agha. Ọ bụ nʼoke ala Izrel niile ka m ga-anọ kpee unu ikpe. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 11:11 E, obodo a agaghị abụrụ unu ite. Unu agaghị anọkwa nʼime ya dịka anụ. Aga m ekpe unu ikpe nʼoke ala Izrel niile.
EZE 11:12 Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na unu bụ ndị na-enupu isi site nʼiwu m na ụkpụrụ m. Ma unu na-agbaso nzọ ụkwụ nke mba ndị ahụ niile gbara unu gburugburu.”
EZE 11:13 Mgbe m ka nọ na-ebu amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ. Mụ onwe m kpuo ihu m nʼala kwaa akwa sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị ga-ebibi ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel?”
EZE 11:14 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 11:15 “Nwa nke mmadụ, ụmụ nke nna gị, ọ bụladị ụmụnna gị, na ndị mgbapụta gị na ezinaụlọ Izrel niile, ọ bụ ha ka ndị bi na Jerusalem sịrị, ‘Ha esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ gaa ebe dị anya, ọ bụkwa anyị ka enyere ala nke a ka ọ bụrụ ihe nnweta anyị,’
EZE 11:16 “Nʼihi nke a, kwuo, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị, Nʼagbanyeghị na m zipụrụ ha gaa ebe dị anya nʼetiti mba dị iche iche, chụsakwaa ha nʼetiti ala dị iche iche, ma nwa mgbe nta, a bụụrụ m ha ebe dị nsọ nʼala niile ahụ bụ ebe ha gara.’
EZE 11:17 “Ya mere kwuo, ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m achịkọtakwa unu ọnụ ọzọ, site nʼobodo niile bụ ebe unu gbasara, nyeghachikwa unu ala Izrel.’
EZE 11:18 “Ha ga-alọghachi nʼebe ahụ, sitekwa nʼetiti ya wezuga oyiyi ihe arụ niile, na arụsị niile bụkwa ihe arụ.
EZE 11:19 Aga m enyekwa ha otu obi, tinyekwa mmụọ ọhụrụ nʼime ha. Aga m ewepụ site nʼime ha obi kpọrọ nkụ ma nye ha obi nke anụ ahụ.
EZE 11:20 Nke a ga-eme ka ha soro ụkpụrụ m na iwu m niile, leziekwa anya idebe ha. Ha ga-abụ ndị nke m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.
EZE 11:21 Ma banyere ndị ahụ obi ha na-agbaso ihe ọjọọ na ihe niile rụrụ arụ, mmehie ha ka m ga-atụkwasị nʼisi ha; otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
EZE 11:22 Mgbe ahụ, cherubim ndị ahụ weliri nku ha elu, wịịlu ndị ahụ dịkwa nʼakụkụ ha ma ebube nke Chineke nke Izrel guzokwa nʼelu ha.
EZE 11:23 Ebube Onyenwe anyị sitere nʼetiti obodo ahụ rigoo, guzo nʼelu ugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
EZE 11:24 Nʼime ọhụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu bubata m na Kaldịa, ebe ndị a dọkpụụrụ gaa mba ọzọ nọ. Otu a ka ọhụ m hụrụ si hapụ m.
EZE 11:25 Agwakwara m ndị niile ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ ihe niile nke Onyenwe anyị gosiri m.
EZE 12:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 12:2 “Nwa nke mmadụ, i bi nʼetiti ndị na-enupu isi, ndị nwere anya ịhụ ụzọ ma ha adịghị ahụ; ndị nwere ntị ịnụ ihe ma ha adịghị anụ ihe, nʼihi na ha bụ ndị nnupu isi.
EZE 12:3 “Ya mere, nwa nke mmadụ, kwakọtaa ngwongwo ụlọ gị maka ị ga biri nʼala ọzọ, mee nke a nʼehihie dịka ha na-ele gị anya, hapụ ụlọ gị gaa nʼebe ọzọ. Ma eleghị anya ha ga-aghọta, ọ bụ ezie na ha bụ ndị nnupu isi.
EZE 12:4 Kwapụta ngwongwo gị nʼezi nʼehihie ka ha hụ ya. Ma hapụ ụlọ gị nʼabalị dịka ndị na-agba ọsọ ndụ si eme, mgbe ha na-amalite ije ha, nke ịga ibi nʼala ọzọ.
EZE 12:5 Mgbe ha na-ele gị anya, gwupuo mgbidi, site na ya kwara ngwongwo gị pụọ.
EZE 12:6 Mgbe ha nọ na-ele gị anya, bulie ibu gị, tụkwasị ya nʼubu gị, pụọ gawa nʼime ọchịchịrị, kpuchie ihu gị, ka ị ghara ihu ala ahụ anya. Nʼihi na emela m gị ihe ịrịbama nye ụlọ Izrel niile.”
EZE 12:7 Emere m ihe e nyere m nʼiwu. Ebupụtara m ngwongwo m nʼehihie, jikọta ha maka ịgba ọsọ ndụ. Nʼanyasị, eji m aka m gwuo ọnụ na mgbidi ahụ. Ebukwasịrị m ngwongwo m nʼubu, bulie ije nʼime ọchịchịrị mgbe ha nọ na-ele m anya.
EZE 12:8 Nʼụtụtụ echi ya, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,
EZE 12:9 “Nwa nke mmadụ, ọ bụ na ụlọ Izrel ndị nnupu isi ahụ ajụbeghị gị, ‘o lee ihe ị na-eme?’
EZE 12:10 “Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Amụma a bụ maka onyeisi nọ na Jerusalem, nʼụlọ Izrel niile nọkwa ebe ahụ.’
EZE 12:11 Sị ha, ‘Mụ onwe m bụ ihe ama nye unu.’ “Dịka m mere, otu a kwa ka a ga-eme nye ha. Ha ga-aga na mba ọzọ biri ka ndị a dọtara nʼagha.
EZE 12:12 “Nwa eze nke nọ nʼetiti ha ga-amaburu ibu ya nʼubu pụọ nʼọchịchịrị, ọ ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo site nʼebe ahụ pụọ. Ọ ga-ekpuchikwa ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ obodo ahụ.
EZE 12:13 Ma aga m eji ụgbụ m jide ya, meekwa ka ọ bịaruo Babilọn bụ ala ndị Kaldịa. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ nwụọ, ma ọ gaghị ahụ ya anya.
EZE 12:14 Ndị niile gbara ya gburugburu na ndị agha ya niile ka m ga-achụsa nʼala niile, ọ bụkwa mma agha ka m ga-amịpụta jiri chụọ ha ọsọ.
EZE 12:15 “Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m chụsachara ha nʼetiti mba niile dị iche iche, fesaakwa ha nʼala niile.
EZE 12:16 Ma ọ bụ mmadụ ole na ole nʼime ha ka m ga-edebe ndụ site na mma agha, na ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Ka ha nwee ike kọọ akụkọ ihe arụ niile ha nʼetiti mba dị iche iche ebe ha gbagara ọsọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
EZE 12:17 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 12:18 “Nwa nke mmadụ, tụọ egwu mgbe ị na-eri nri gị. Jirikwa ihe ọtụtụ tụpụta mmiri ọṅụṅụ gị, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe ikpeazụ i nwere.
EZE 12:19 Ị ga-asịkwa ndị bi nʼala ahụ, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị bi na Jerusalem, nʼala nke Izrel, sị, Ha ga-eji ụjọ rie achịcha ha, jirikwa obi ịlọ mmiri ṅụọ mmiri ha, nʼihi na a ga-ekpochapụ ihe niile dị nʼala ha, nʼihi ihe ike nke ndị bi nʼime ya.
EZE 12:20 Obodo niile nke ndị mmadụ bi nʼime ya ga-ala nʼiyi, otu aka ahụ, ala unu niile ga-abụ ebe tọgbọrọ na nkịtị. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe bụ Onyenwe anyị.’ ”
EZE 12:21 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 12:22 “Nwa nke mmadụ, kedụ ihe ilu a na-atụ nʼIzrel pụtara, nke na-asị ‘Ụbọchị adịla oke anya, ọhụ niile abụrụkwala ihe na-enweghị isi?’
EZE 12:23 Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ilu a kwụsị, ha agaghị atụkwa ya dịka ilu nʼIzrel ọzọ.’ Kama gwa ha, ‘Nʼụbọchị ahụ adịla nso mgbe ọhụ niile ga-emezu.
EZE 12:24 Nʼihi na agaghị enwekwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ ịjụ ase ire ụtọ nʼetiti ụlọ Izrel.
EZE 12:25 Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-ekwu ihe m zubere. Ihe ọbụla m kwuru ga-emezu na-atụfughị oge. Nʼihi na ọ bụ nʼoge unu dị ndụ, unu ndị nnupu isi, ka m ga-emezu ihe ọbụla bụ nke m kwuru. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
EZE 12:26 Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
EZE 12:27 “Nwa nke mmadụ, lee, ụlọ nke Izrel na-asị, ‘Ọhụ niile ọ na-ahụ bụ maka ọtụtụ afọ dị nʼihu, amụma ya bụkwa maka oge na-abịa nʼihu.’
EZE 12:28 “Nʼihi ya, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, ọ dịghịkwa okwu m nke a ga-atụfu oge ọzọ nʼime ya, ihe ọbụla m kwuru ka a ga-emezu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
EZE 13:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 13:2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị amụma nke Izrel ndị na-ebu amụma ugbu a, gwa ndị amụma ahụ na-ekwu ihe sitere ha nʼuche: ‘Nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị.
EZE 13:3 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ahụhụ ga-adịrị ndị amụma nzuzu ndị na-agbaso mmụọ nke onwe ha, ndị ọ dịghị ihe ha na-ahụ.
EZE 13:4 Gị Izrel, lee, ndị amụma gị niile dị ka nkịta ọhịa bi na mkpọmkpọ ebe.
EZE 13:5 Unu arịgobeghị na oghere jupụtara na mgbidi maọbụ rụzie mgbidi aja ndị ahụ maka nchekwa ndị Izrel ka o nwee ike kwudosie ike nʼụbọchị agha nke Onyenwe anyị.
EZE 13:6 Ọhụ ha bụ ụgha, otu a, ịjụ ase ha bụkwa ụgha, ha na-asị, “Onyenwe anyị kwupụtara,” ebe Onyenwe anyị ezipụghị ha, ha na-agakwa nʼihu na-atụ anya ka o mezuo okwu ha.
EZE 13:7 Ọ bụghị ọhụ ụgha ka unu hụrụ, ọ bụghịkwa okwu ịjụ ase ụgha ka unu kwuru, mgbe unu na-asị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m ekwughị okwu?
EZE 13:8 “ ‘Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m ebibi unu nʼihi okwu ụgha na ọhụ ụgha unu niile. Edoola m onwe m imegide unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 13:9 Aka m ga-emegide ndị amụma niile ahụ bụ ndị na-ahụ ọhụ ụgha, na-agbakwa afa ụgha. Ha a gaghị esonye na otu ọgbakọ ndị m maọbụ bụrụ ndị agụnyekọrọ nʼakwụkwọ ndekọta aha ụlọ nke Izrel, ha agaghị abakwa nʼala ndị Izrel. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
EZE 13:10 “ ‘Nʼihi na ha eduhiela ndị m, mgbe ha na-asị, “Udo,” ebe udo na-adịghị, nʼihi na mgbe e wuru mgbidi na-esighị ike, ndị amụma ndị a jara ha mma, werekwa nzu techie ya.
EZE 13:11 Ya mere, gwa ndị ahụ jiri nzu techie mgbidi ahụ na ọ ga-ada. Oke mmiri ozuzo nke ga-ezobiga oke ga-ezo, aga m ezitekwa mkpụrụ mmiri dị ukwuu nke ga-ada, na oke ifufe nke ga-akwada ya.
EZE 13:12 Mgbe mgbidi ahụ dara, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ, “Olee ebe mgba ọcha ahụ ị ji techie ya dị?”
EZE 13:13 “ ‘Ya mere, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m eji oke ifufe nke ọnụma m, na oke mmiri ozuzo nke iwe m, ma oke akụmmiri nke oke iwe m mebie ya.
EZE 13:14 Aga m akwada mgbidi ahụ unu tere nzu, aga m emekwa ka ọ daruo ala nke ga-eme ka ahụ ntọala ya anya; ọ ga-adakwasịkwa unu, gwepịa unu. Mgbe ọ dara ọ ga-egbuchapụ unu niile; unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 13:15 Otu a ka m ga-esi gosipụta iwe m nʼebe mgbidi ahụ nọ, na nʼahụ ndị ahụ ji nzu techie ya. Aga m asị unu, “Mgbidi ahụ adịghịkwa, otu a ka ọ dịkwa ndị ahụ ji nzu techie ya,
EZE 13:16 bụ ndị amụma Izrel ndị ahụ buru amụma nye Jerusalem, ndị hụkwara ya ọhụ udo mgbe udo na-adịghị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.” ’
EZE 13:17 “Ma ugbu a, gị nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe ụmụada ndị unu nọ, ndị nke na-ebu amụma dị ka o si si ha nʼobi pụta. Buo amụma megide ha
EZE 13:18 sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Ahụhụ dịrị ndị inyom na-adụnye ọgwụ mgbaasị na nkwoji aka ha na-emekwa akwa mgbokwasị nke ikpuchi isi maka ndị mmadụ dị iche iche, iji raata ha. Unu si aṅaa chee na unu ga-echebe ndụ unu mgbe unu buru ụzọ mee ka ndị m maa nʼọnya?
EZE 13:19 Unu emeela ka m ghara ịdị nsọ nʼetiti ndị m, nʼihi mkpoju aka ọka balị na iberibe achịcha ole na ole. Nʼihi ya, unu emeela ka ha nwụọ bụ ndị na-ekwesighị ịnwụ anwụ. Unu edebekwala ha ndụ bụ ndị na-ekwesighị ịdị ndụ, site nʼokwu ụgha unu na-agwa ndị m, bụ ndị na-aṅa ntị nʼokwu ụgha.
EZE 13:20 “ ‘Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ana m emegide ọgwụ mgbaasị niile nke unu ji achụ nta mkpụrụobi ndị m dịka nnụnụ. Aga m adọwapụ ha site nʼaka unu, napụtakwa ndị m, bụ ndị unu ji nʼọnya dị ka nnụnụ e tinyere nʼụlọ akpara akpa.
EZE 13:21 Aga m adọwa akwa mgbokwasị ọgwụ unu, napụta ndị m site nʼaka unu. Ha agaghị amakwa nʼọnya nke ike unu ọzọ. Nʼụzọ dị otu a unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 13:22 Nʼihi na ụgha unu emeela ka obi ndị ezi omume daa mba, mgbe ọ na-abụghị uche m na ihe dị otu a ga-eme. Ma unu emeela ka obi ndị ajọ omume sie ike site na nkwa ogologo ndụ unu kwere ha, mee ka ha ghara isite nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa ma zọpụta ndụ ha.
EZE 13:23 Nʼihi nke a, unu agaghị ahụkwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ gbaa afa. M ga-anapụta ndị nke m site nʼaka unu. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
EZE 14:1 Ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel bịakwutere m, nọdụ ala nʼihu m.
EZE 14:2 Mgbe ahụ okwu Onyenwe anyị ruru m ntị,
EZE 14:3 “Nwa nke mmadụ, ndị ikom ndị a na-efe arụsị nʼime obi ha, ma tinyekwa ihe ịsụ ngọngọ nke ajọ omume ya nʼihu ha. Aga m ekwenye ka ha jụta m ase ọbụla?
EZE 14:4 Ya mere, gwa ha okwu sị ha ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe onye Izrel ọbụla na-agbaso arụsị nʼobi ya, nke na-ekwekwa ka arụsị ndị a na-eduba ya na mmehie, bịakwutere onye amụma ịjụta ya ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza onye ahụ dịka o si dị, ya bụ dịka ịba ụba nke arụsị ya niile si dị.
EZE 14:5 Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi nwetaghachikwa obi ndị Izrel niile bụ ndị si nʼebe m nọ wezuga onwe ha, ma malite ife arụsị.’
EZE 14:6 “Nʼihi ya, gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Chegharịanụ! Sitenụ nʼife arụsị unu niile chigharịa, jukwanụ omume unu niile rụrụ arụ.
EZE 14:7 “ ‘Nʼihi na onye ọbụla nʼụlọ Izrel maọbụ onye ọbụla nʼime ndị ọbịa bi nʼala Izrel, nke kewapụrụ onwe ya site nʼiso m, si otu a mee ka arụsị ọ na-efe baa ya nʼobi, nke na-etinye ihe ịsọ ngọngọ ajọ omume nʼihu ha, mechaa, gakwuru onye amụma maka isite nʼaka ya ịjụta m ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-azaghachi ha.
EZE 14:8 Aga m edokwa onwe m imegide ha, mee ka ha bụrụ ihe ịmaatụ na ilu nye ndị ọzọ. Aga m esitekwa nʼetiti ndị m wezuga ha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 14:9 “ ‘Ọ bụrụ na arafuo onye amụma ahụ ka o buo amụma, ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị rafuru onye amụma ahụ. Aga m esetipụ aka m megide ya, bipụkwa ya site nʼetiti ndị m, bụ Izrel.
EZE 14:10 Ha ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie ikpe ọmụma ha, dịka ikpe ọmụma dịrị onye na-ajụ ase, otu a ka ọ ga-adịkwa nye onye amụma ụgha ahụ.
EZE 14:11 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel agaghị esitekwa nʼiso m kpafuo ọzọ. Ha agakwaghị eji mmehie merụọ onwe ha, kama ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya.’ ”
EZE 14:12 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 14:13 “Nwa nke mmadụ, ọ bụrụ na ndị bi nʼala emehie megide m, site nʼekwesighị ntụkwasị obi ha, ọ bụrụ na m esetipụ aka m mee ka oke ụnwụ bịakwasị ha, ọ bụrụkwa na m emee ka mmadụ na anụmanụ niile dị nʼala a nwụchasịa,
EZE 14:14 a sịkwa na Noa, Daniel na Job bi nʼetiti ya, ha ga-azọpụta naanị onwe ha nʼezi omume ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
EZE 14:15 “Asị na m eziga anụ ọhịa ọjọọ ka ha bịa bibie ala ahụ, mee ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu meekwa ka mmadụ ọbụla ghara ị site nʼime ya gafee nʼihi anụ ọhịa ndị ahụ,
EZE 14:16 dịka m na-adị ndụ ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ọ bụrụkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼebe a, ha agaghị anapụta ọ bụladị ụmụ ha ndị nwoke maọbụ ụmụ ha ndị nwanyị site nʼịla nʼiyi. Naanị ha ka a ga-azọpụta, ma ala ahụ ga-abụ ihe tọgbọrọ nʼefu.
EZE 14:17 “Ọ bụrụ na a sị na m mere ka mma agha bịakwasị ala ahụ, m sị, ‘Ka mma agha gabiga site nʼala ahụ niile gburugburu,’ ma gbuo mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya,
EZE 14:18 dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼala ahụ, ha agaghị anapụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Kama, ọ bụ naanị ha onwe ha ka a ga-anapụta.
EZE 14:19 “Ọzọkwa, ọ bụrụ na m eziga oke iwe m site nʼajọ ọrịa na-efe efe, ọ bụrụ na ọrịa ahụ egbuo mmadụ na anụmanụ ha niile,
EZE 14:20 dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwa na Noa, Daniel na Job bi nʼime ya, ha agaghị anapụta ụmụ ha ndị ikom maọbụ ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Ha ga-azọpụta naanị onwe ha nʼezi omume ha.
EZE 14:21 “Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, a ga-esi aṅaa napụta ya, mgbe m zipụrụ ụzọ ikpe m anọ dị oke egwu nke na-echere Jerusalem. Ikpe ndị a bụ: mma agha na ụnwụ, anụ ọhịa ọjọọ na-adọgbu adọgbu na ọrịa na-efe efe, ka ha gbuchapụ mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya.
EZE 14:22 Ma a ga-enweta ụfọdụ ndị ga-afọdụ ndụ, bụ ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị a ga-anapụta site nʼahụhụ ndị a. Ha ga-abịakwute unu. Mgbe unu hụrụ omume ha, na obibi ndụ ha, ha ga-abụrụ unu ihe nkasiobi nʼihi na unu ga-esite na ha mata ụdị mbibi nke m mere ka ọ bịakwasị Jerusalem.
EZE 14:23 A ga-akasịkwa unu obi mgbe unu hụrụ omume ha na obibi ndụ ha, unu ga-amatakwa na ọ bụghị nʼefu ka m mere ka ihe ndị a niile dakwasị ha.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
EZE 15:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 15:2 “Nwa nke mmadụ, olee, ụzọ osisi vaịnị si pụọ iche site nʼalaka osisi ndị ọzọ dị nʼime oke ọhịa?
EZE 15:3 A na-esi nʼime osisi ya were mepụta ihe ọbụla bara uru? Ọ bụ site na ya ka a na-esi emepụta osisi nke e ji ekonye ihe?
EZE 15:4 Uru ha bara bụ iji ha menye ọkụ. Ma mgbe isi ya abụọ repịara, mgbe etiti ya rekwara ọkụ, o nwere ihe ọzọ mmadụ nwere ike iji ya mee?
EZE 15:5 Ọ bụrụ na ọ baghị uru mgbe o zuruoke, a ga-esi aṅa were ya mepụta ihe bara uru mgbe ọkụ repịasịrịla ya, ọ ghọọ unyi?
EZE 15:6 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, dịka m sitere nʼetiti ọhịa niile wepụta osisi vaịnị nye ka ọ bụrụ nkụ e ji emenye ọkụ, otu a ka m ga-esi mesoo ndị bi na Jerusalem.
EZE 15:7 Aga m eche ihu m imegide ha. Ọ bụ ezie na ha esitela nʼọkụ pụta, ma ọkụ ga-erepịa ha. Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m guzoro onwe m megide ha.
EZE 15:8 Aga m emekwa ka ala ha tọgbọrọ nʼefu, nʼihi na ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
EZE 16:1 Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
EZE 16:2 “Nwa nke mmadụ, gwa Jerusalem okwu mee ka ọ mara banyere ndụ ya niile rụrụ arụ
EZE 16:3 sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Jerusalem: Ịpụta ụwa gị na ọmụmụ gị bụ nʼala ndị Kenan; nna gị bụ onye Amọrị, nne gị bụ onye Het.
EZE 16:4 Nʼụbọchị ahụ a mụrụ gị, ebeghị otubo gị, ọ dịghị onye lekọtara gị maọbụ jiri mmiri saa gị ahụ ị sachapụ gị unyi maọbụ tee gị nnu, maọbụ jiri akwa kechie gị.
EZE 16:5 Ọ dịghị onye nwere obi ebere nʼebe ị nọ. Ọ dịghị onye ihe banyere gị metụrụ nʼobi, ọ dịkwaghị onye lekọtara gị. Kama nʼụbọchị ahụ a mụrụ gị a tufuru gị nʼọhịa, nʼihi na-eledara gị anya.
EZE 16:6 “ ‘Ma mgbe m si nʼebe ahụ ị tọgbọ na-agafe, ahụrụ m gị ka i chịlịri ụkwụ gị, ọbara jukwara gị ahụ, dịka ị dina nʼime ọbara gị. Nʼoge ahụ, ihe pụrụ m nʼọnụ bụ, “Dị ndụ.”
EZE 16:7 Emere m ka ị too dịka osisi na-eto eto nʼime ọhịa. I tolitere, too ogologo ma tozuo oke na nwanyị, ị kpụrụ ara, agịrị isi gị pukwara, ma gị onwe gị gba ọtọ.
EZE 16:8 “ ‘Emesịa, a gafere m nʼakụkụ gị, mgbe m lere gị anya ahụrụ m na i tozuola onye mmadụ ga-ahụ nʼanya. A gbasapụrụ m akụkụ akwa m nʼahụ gị, jiri ya kpuchie ọtọ gị. Aṅụrụ m gị iyi, mụ na gị gbara ndụ, ị ghọkwara nke m. Ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
EZE 16:9 “ ‘Eji m mmiri saa gị ahụ, sachapụ ọbara dị gị nʼahụ, teekwa gị mmanụ.
EZE 16:10 Enyere m gị akwa ọcha na uwe a kpara nke ọma, nke i ji kpuchie ahụ gị. Nyekwa gị akpụkpọụkwụ e ji ezi akpụkpọ kwaa, jirikwa ezi akwa ọcha na uwe ndị dị oke ọnụ kpuchie gị.
EZE 16:11 Eyinyere m gị ihe ịchọ mma, tinye ọlaaka nʼaka gị, nakwa ọlaolu nʼolu gị.
EZE 16:12 Etinyekwara m gị ọla nʼimi, tinye gị ọlantị abụọ na ntị gị, na okpueze mara mma nʼisi gị.
EZE 16:13 E ji ihe ịchọ mma ọlaọcha na ọlaedo chọọ gị mma. Uwe gị bụkwa uwe ezi akwa ọcha, uwe dị oke ọnụ, na uwe a kpara nke ọma. Nri ị na-eri bụ ụtụ ọka a yọchaziri nke ọma, na mmanụ aṅụ, na mmanụ oliv. Mma gị pụtaziri ihe nke ọma, ị ruo ogo ịbụ eze nwanyị.
EZE 16:14 Aha gị dara ụda nke ukwuu nʼetiti mba dị iche iche nʼihi mma gị, nke zuruoke site nʼebube ahụ bụ nke m tụkwasịrị gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
EZE 16:15 “ ‘Ma ị tụkwasịrị mma gị obi, jiri nʼihi na a mara aha gị ghọọ onye akwụna. I wekwaara onwe gị nye nwoke ọbụla gabigara mee ka mma gị bụrụ nke ya.
EZE 16:16 Ị were uwe gị ụfọdụ, meere onwe gị ebe dị iche iche dị elu nke tụrụ agwa, ebe doziri ihe ndina ịkwa iko gị. Ihe dị otu a emetụbeghị mbụ, ha ekwesịkwaghị ime mgbe ọbụla.
EZE 16:17 Ị chịrị ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ mara mma, bụ nke m nyere gị, were ha kpụọrọ onwe gị oyiyi nwoke dị iche iche, ndị ị na-akpọ isiala nye. Nʼụzọ dị otu a ka gị na ha si na-akwakọ iko.
EZE 16:18 Uwe ọma ahụ a kpara akpa ka i ji kpuchie ha. Mmanụ m na ụda m na-esi isi ụtọ ka ị chere nʼihu ha dịka onyinye.
EZE 16:19 Ọzọkwa, ụtụ ọka ọma, mmanụ oliv na mmanụ aṅụ, nri ndị m nyere gị ka i rie, ka i ji chụọ aja na-esi isi ụtọ nʼihu ha. Otu a ka o si dị, ka Onyenwe anyị Onyenwe anyị kwupụtara.
EZE 16:20 “ ‘Ụmụ niile ị mụtaara m, nwoke na nwanyị, ka i ji chụọrọ arụsị gị aja ka ha rie. Ọ bụ na ịgba akwụna gị ezughịrị gị?
EZE 16:21 Ma i gburu ụmụ m, jiri ha chụọ aja nye arụsị!
EZE 16:22 Nʼoge ndị a niile ị na-akwa iko, na-eme ihe arụ ndị a niile, o metụbeghị gị nʼobi ka i cheta ụbọchị niile ndị ahụ ị bụ nwantakịrị, mgbe ị nọ na-agba ọtọ, mgbe ọbara jupụtara gị nʼahụ.
EZE 16:23 “ ‘Ahụhụ, ahụhụ, ga-adịrị gị, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Tinyekwara ajọ omume gị niile,
EZE 16:24 i wuuru arụsị gị ụlọ ebe ịkwa iko, wuokwa ụlọ arụsị ndị ọzọ nʼakụkụ okporoụzọ niile.
EZE 16:25 I wuuru onwe gị ebe ịchụ aja e wuliri elu dị iche iche nʼisi ụzọ niile, si otu a merụọ mma gị. Nʼebe ahụ ka ị na-anọ na-emeghere onye ọbụla gafetara ụkwụ gị abụọ, mee ka ịkwa iko gị na-amụbanye.
EZE 16:26 Ị kwasoro ndị Ijipt bụ ndị agbataobi gị iko, ndị anụahụ ha dị ukwuu. I si otu a mee ka iwe dị ukwuu wee m megide ịkwa iko gị nke na-aba ụba.
EZE 16:27 Nʼihi ya, esetipụrụ m aka megide gị, e webilatara m oke ala gị ka ọ dị ntakịrị; ewere m gị nyefee oke ọchịchọ nke ndị iro gị, bụ ndị inyom Filistia, ndị ihere mere nʼihi omume gị niile ruru unyi.
EZE 16:28 Gị na ndị Asịrịa akwaala iko, nʼihi na afọ adịghị eju gị. Ọ bụladị mgbe nke a gasịrị, ị bụkwa onwe na-enweghị afọ ojuju.
EZE 16:29 I mere ka ịkwa iko gị mụbaa ruo ala ndị Kaldịa, mba ahụ ịzụ ahịa doro anya. Ma ọbụladị na nke a afọ ejughịkwa gị.
EZE 16:30 “ ‘Iwe m dị ọkụ megide gị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Mgbe ị na-eme ihe ndị a, ị na-eme ha nnọọ dị ka onye akwụna nke ihere adịghị eme.
EZE 16:31 Mgbe ị rụrụ ụlọ arụsị nʼisi ụzọ niile, wuokwa ụlọ ịkwa iko gị na mbara ụzọ niile, i meghị ya dịka akwụna, nʼihi na ị jụrụ ịnara ndị gị na ha kwara iko ego ọbụla.
EZE 16:32 “ ‘Nʼezie, ị bụ nwanyị na-akwa iko ma ị nọ na di, onye na-anabata ndị ikom ọzọ karịa di ya!
EZE 16:33 Ndị akwụna niile na-anata onyinye, ma gị onwe gị na-enye ndị ikom niile hụrụ gị nʼanya onyinye, inye ha ngarị ka ha bịakwute gị site nʼebe niile bịakwute gị nʼihi ịgba akwụna gị.
EZE 16:34 Nʼihi ya, ị dị iche nʼetiti ndị inyom ndị ọzọ nʼụdị ịgba akwụna gị, o nweghị onye na-agbaso gị na-arịọ gị maka ịkwaso gị iko. Ị kwụrụ ụgwọ ma o nweghị ụgwọ a kwụrụ gị, nʼụzọ dị otu a ị dị iche.
EZE 16:35 “ ‘Nʼihi nke a, gị nwanyị akwụna, nụrụ okwu Onyenwe anyị!
EZE 16:36 Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nʼihi na ị wụpụrụ agụụ nke anụ ahụ gị, kpugheekwa ọtọ gị nʼịkwa iko gị nke gị na ndị ị hụrụ nʼanya na-akwa, na nʼihi arụsị gị niile rụrụ arụ, nakwa nʼihi na ị nyere ha ọbara ụmụ gị,
EZE 16:37 nʼihi ya, aga m achịkọta ndị niile bụ ndị ahụ niile ị hụrụ nʼanya, ndị gị na ha na-enwe obi ụtọ, ndị ị hụrụ nʼanya, ma ndị ị kpọrọ asị. Aga m achịkọta ha site gburugburu gị imegide gị, gbaa gị ọtọ nʼihu ha, ka ha hụ ọtọ gị niile.
EZE 16:38 Aga m ata gị ahụhụ a na-ata ndị inyom na-akwa iko, na ndị inyom na-egbu mmadụ. Aga m eme ka ịbọ ọbọ ọbara nke ọnụma m, ya na ekworo m, bịakwasị gị.
EZE 16:39 Aga m enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị hụrụ nʼanya, bụ ọtụtụ mba ahụ dị iche iche. Ha ga-ebibi gị, kwada ụlọ ịkwa iko gị, na ụlọ arụsị gị niile dị elu, gbaa gị ọtọ, narakwa gị uwe gị niile, na ihe ịchọ mma gị niile, hapụ gị ka ihere mee gị.
EZE 16:40 Ha ga-akpọta igwe mmadụ ga-emegide gị, ndị ga-atụ gị nkume, jirikwa mma agha ha bọkasịa gị.
EZE 16:41 Ha ga-agba ụlọ gị ọkụ ma takwaa gị ahụhụ nʼihu ọtụtụ ndị inyom. Aga m ahụkwa na ị kwụsịrị ịkwa iko ị na-akwa, ị ga-akwụsịkwa ịkwụ ụgwọ ahụ ị na-akwụ ndị iko gị.
EZE 16:42 Mgbe ahụ, oke iwe m megide gị ga-adajụ, ekworo m ga-esite nʼebe ị nọ gabiga. Aga m anọ nwayọọ gharakwa iwe iwe ọzọ.
EZE 16:43 “ ‘Ebe ọ bụ na ị chetaghị ụbọchị ndị ahụ niile, mgbe ị dị nʼagbọghọbịa, ma i ji ihe ọjọọ ndị a niile ị na-eme kpasuo m iwe. Ya mere, aghaghị m ịkwụghachi gị dịka mmehie gị si dị. Ọ bụ na i meghị omume ndị a rụrụ arụ, tinyekwara mmehie agụụ ịkwa iko? Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 16:44 “ ‘Lee, onye ọbụla na-atụ ilu, ga-atụ ilu a banyere gị sị, “Otu ọ dị nne ka ọ dị nwa ya nwanyị.”
EZE 16:45 Nʼezie, ị dị ka nne gị, nʼihi na nne gị kpọrọ di ya na ụmụ ya asị. Ị dịkwa ka ụmụnne gị ndị inyom. Ha na-akpọ di ha na ụmụ ha asị. Nʼezie, nne gị bụ onye Het, nna gị bụkwa onye Amọrị.
EZE 16:46 Ada nne gị bụ Sameria, ya na ụmụ ya bi nʼugwu. Nwanne gị nwanyị nke nta bụ Sọdọm, ya na ụmụ ya bi nʼala ndịda.
EZE 16:47 Ọ bụghị naanị na ị soro ụzọ ha niile, ị ṅomiri omume ibi ndụ arụ ha niile, kama dịka a ga-asị na nke a bụ ihe nta, nʼụzọ gị niile, ị ghọrọ onye rụrụ arụ karịa ha.
EZE 16:48 Ebe m na-adị ndụ, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Sọdọm na ụmụ ya ndị inyom emetụbeghị ihe ndị a gị na ụmụ gị ndị inyom mere.
EZE 16:49 “ ‘Mmehie nwanne gị nwanyị Sọdọm bụ nganga, na umengwụ, na oke oriri. Ha jụrụ inyere ndị nọ na mkpa, na ndị agụụ na-agụ nọ nʼọnụ ụzọ ha aka.
EZE 16:50 Ha dị elu nʼobi ha, mee ihe arụ nʼihu m. Nʼihi ya, esitere m nʼihu m wezuga ha dịka ị hụrụ.
EZE 16:51 Ọ bụladị Sameria emerughị ọkara mmehie niile i mere. I meela ihe arụ bara ụba karịa nke ha mere, si otu a gụọ ụmụnne gị ndị inyom ka ndị ezi omume site nʼihe ndị a niile nke ị mere.
EZE 16:52 Gị onwe gị buru ihe ihere gị, nʼihi na omume gị ekpepụtala ụmụnne gị ndị inyom. Nʼihi na mmehie gị dị njọ, dịkwa ukwuu karịa nke ha, ha bụ ndị a gụrụ na ndị ezi omume karịa gị. Ya mere, ka ihere mee gị, burukwa ọnọdụ ihere gị, nʼihi na ị meela ka a gụọ ụmụnne gị ndị inyom dịka ndị ezi omume.
EZE 16:53 “ ‘Ma otu ọ dị, aga m eme ka ọganihu nke Sọdọm na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke Sameria na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke gị dịghachikwa nʼetiti ha:
EZE 16:54 Ka i nwee ike bụrụ ọnọdụ ihere gị, ka ihere mekwa gị nʼihi ihe niile i mere, nʼịkasị ha obi.
EZE 16:55 Ọzọ ndị ụmụnne gị nwanyị bụ Sọdọm na Sameria na ụmụ ha ndị inyom ga-alọta nʼọnọdụ mbụ ha; gị na ụmụ gị ndị inyom ga-alọtakwa nʼọnọdụ mbụ unu.
EZE 16:56 Ma ị pụghị emeghe ọnụ gị kpọọ aha nwanne gị nwanyị bụ Sọdọm nʼụbọchị nganga gị,
EZE 16:57 tupu e kpughe ajọ omume gị. Ọ bụladị otu ahụ, ugbu a ị bụ ihe ịkwa emo nye ndị ada Edọm na ndị agbataobi ya niile, na ndị ada ndị Filistia. Ndị niile nọ gị gburugburu na-elelịkwa gị anya.
EZE 16:58 Ị ga-anata ụgwọ ọrụ nke ịkwa iko gị, na ihe arụ ndị ọzọ ị na-eme. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
EZE 16:59 “ ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị, nʼihi na ị ledara iyi ahụ ị ṅụrụ anya site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ.
EZE 16:60 Ma otu ọbụla o si dị, aga m edebezu nkwa ahụ niile m kwere gị mgbe ị dị na nwantakịrị. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ahụ dị nʼetiti mụ na gị guzosie ike ruo ebighị ebi.
EZE 16:61 Mgbe ahụ, ị ga-echeta ụzọ gị niile, ma nwee ihere, mgbe m ga-ewere ụmụnne gị ndị inyom ndị ahụ tọrọ gị na ndị nke ị tọrọ nye gị ha dịka ụmụ, ma ọ bụghị nʼihi ọgbụgba ndụ m.
EZE 16:62 Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị guzosie ike, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 16:63 Mgbe ahụ, aga m ekpuchiri gị ajọ omume niile bụ nke ị mere. Ihere ga-eme gị mgbe i chetara ndụ ọjọọ gị, ị gaghị emeghekwa ọnụ gị kwuo okwu nʼihi oke mweda nʼala gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
EZE 17:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 17:2 “Nwa nke mmadụ, tụọ ilu kọwaara ụlọ Izrel akụkọ ihe ọmụma atụ.
EZE 17:3 Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, otu ugo nke nwere nku abụọ buru ibu, nke abụba ya tụrụ agwa agwa ma dịkwa ogologo, feere bịa na Lebanọn, tụjiri ọnụ ọnụ osisi sida kachasị ibe ya ogologo.
EZE 17:4 Ọ kubipụrụ ọnụ ọnụ alaka osisi a, buru ya gaa nʼala ebe ọtụtụ ndị na-azụ ahịa juru, kụọ ya nʼobodo ahụ.
EZE 17:5 “ ‘O sitekwara nʼala ahụ were otu mkpụrụ kụọ ya nʼala mara nnọọ ezi mma. Ọ kụrụ ya dịka e si akụ osisi wilo nʼakụkụ ebe enwere ụba mmiri.
EZE 17:6 Ọ dịghị anya, mkpụrụ osisi ahụ gbara mgbọrọgwụ, too, ghọọ osisi vaịnị dị mkpụmkpụ, nke na-awasa awasa, nke alaka ya niile chere ihu nʼebe ugo ahụ nọ. O nwekwara alaka siri ike, na akwụkwọ mara mma.
EZE 17:7 “ ‘Ma e nwekwara ugo ọzọ, nke nwere nku sara mbara, nke jupụtara nʼabụba. Mgbe ugo a bịara, osisi vaịnị a gbasakwara mgbọrọgwụ ya na alaka ya, chee ugo ahụ ihu, ka ọ gbakwasị ya mmiri.
EZE 17:8 A kụrụ ya nʼebe ala dị mma, nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ka o nwee ike wapụta ngalaba, mịa mkpụrụ, ghọọkwa ezigbo vaịnị mara mma.’
EZE 17:9 “Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ ga-adịhụkwa? Ọ bụ na agaghị ehopu mgbọrọgwụ ya niile, bipụkwa mkpụrụ ya niile mee ka ọ kpọnwụọ? Ka akwụkwọ ndụ niile nke na-epute ọhụrụ kpọnwụọ. Ọ gaghị ewekwa ogwe aka dị ike maọbụ ọtụtụ ndị mmadụ ihopụta ya site na mgbọrọgwụ ya.
EZE 17:10 A kụọla ya ma ọ ga-etokwa? Ọ gaghị akpọnwụ kpamkpam mgbe oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ feturu ya, kpọnwụchakwaa nʼala ebe ahụ ọ nọ puo?’ ”
EZE 17:11 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 17:12 “Ugbu a, gwa ndị nnupu isi ahụ, ‘unu maara ihe ilu a pụtara?’ Sị ha, ‘Lee, Babilọn bịara na Jerusalem dọkpụrụ eze ya na ndị ọchịchị ya laa Babilọn.
EZE 17:13 O were otu onye site nʼezinaụlọ eze, ya na ya gbara ndụ, bụ onye o mere ka ọ ṅụọ iyi. O sitekwara nʼala ahụ bupụ ndị ndu obodo ahụ niile.
EZE 17:14 Nʼụzọ dị otu a, alaeze ahụ ghọrọ alaeze e wedara nʼala nke ukwuu, nke na-enweghịkwa ike ibili ọzọ. Ọganihu nke alaeze ahụ dabeere naanị na ndebe ha debere ọgbụgba ndụ ahụ.
EZE 17:15 Ma o nupuru isi nʼokpuru ya site nʼiziga ndị ozi nʼIjipt ka ha nye ya ọtụtụ ịnyịnya na ndị agha. Ọ ga-enwetakwa ihe ọ chọrọ? Onye na-eme ihe dị otu a, ọ pụrụ ịgbanarị ntaramahụhụ? Ọ pụrụ imebi ọgbụgba ndụ ma gbalaga?
EZE 17:16 “ ‘Nʼezie, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, ọ ga-anwụ na Babilọn, nʼala nke eze ahụ mere ka ọ nọkwasị nʼocheeze, bụ onye o ledara ịṅụ iyi ya anya mebikwaa ọgbụgba ndụ ya.
EZE 17:17 Nʼagbanyeghị igwe ndị agha ya siri ike, Fero agaghị enwe ike zọpụta ya nʼagha, mgbe ha ga-ewulite mgbidi agha, gwuokwa olulu nnọchibido iji gbuo ọtụtụ mmadụ.
EZE 17:18 O lelịrị ịṅụ iyi ahụ site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ. Nʼihi na o nyere aka ya nʼihe ibe ma gaa nʼihu mee ihe ndị a niile, mgbapụ agaghị adịrị ya.
EZE 17:19 “ ‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, aga m akwụghachi ya nʼihi nleda anya o ledara ịṅụ iyi m nakwa nʼihi ọgbụgba ndụ nke o mebiri.
EZE 17:20 Aga m agbasa ụgbụ m nʼụzọ o si aga; ọnya m ga-amakwa ya. Aga m ewetakwa ya na Babilọn, nọdụkwa nʼebe ahụ taa ya ahụhụ nʼihi na ọ kwesighị ntụkwasị obi nye m.
EZE 17:21 Mma agha ka a ga-eji gbuo ndị agha ya niile na-agbapụ ọsọ, ndị niile fọdụrụ ka a ga-achụsasị nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
EZE 17:22 “ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m ga-esi nʼọnụ ọnụ osisi kachasị mma nke osisi sida kachasị elu kụrụ ihe m ga-akụ. Aga m esi nʼọnụ ọnụ osisi sida dị elu kụrụ alaka dị nro, nke m ga-akụ nʼugwu dị ezigbo elu.
EZE 17:23 Ọ bụ nʼelu ugwu niile nke Izrel ka m ga-akụnye ya. Ọ ga-awapụtakwa alaka ya, mịa mkpụrụ, bụrụkwa sida mara oke mma. Ụmụ nnụnụ dị iche iche ga-ewu akwụ ha na ya, ha ga-achọtakwa ebe obibi na ndo nke alaka ya niile.
EZE 17:24 Nʼoge ahụ, osisi ọhịa niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ onye na-egbuda osisi niile dị elu, ma na-ewelikwa ndị dị nta elu. Na ọ bụ m na-eme ka osisi dị ndụ kpọnwụọ, ma na-emekwa ka nke nwụrụ anwụ dịrị ndụ. “ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Aghakwaghị m ime ya.’ ”
EZE 18:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, sị,
EZE 18:2 “Gịnị ka unu bụ mmadụ na-ekwu mgbe unu na-atụ ilu a banyere ala Izrel? “ ‘Ndị bụ nna eriela mkpụrụ vaịnị na-achaghị acha, eze ụmụntakịrị a na-eru ha izizi.’
EZE 18:3 “Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, unu agaghị atụkwa ilu a ọzọ nʼala Izrel.
EZE 18:4 Nʼihi na mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, ha niile bụ nke m. Mkpụrụobi ọbụla mehiere bụ nke ga-anwụ.
EZE 18:5 “Ọ bụrụ na-enwere otu onye ezi omume nke na-eme naanị ihe ziri ezi na ihe dị mma,
EZE 18:6 onye na-adịghị eje nʼugwu iri oriri maọbụ welie anya ya nʼebe arụsị niile nke Izrel dị, onye na-adịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya, maọbụ dinakwuru nwanyị nọ nʼoge nsọ ya.
EZE 18:7 Onye na-adịghị emegbu ndị mmadụ, kama ọ na-akwụghachi ụgwọ o ji, maọbụ na-enyeghachi ihe ọ naara dịka ihe mbe, ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike, kama ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri, na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi.
EZE 18:8 Ọ dịghị agbazinye mmadụ ego nara mụrụ nwa, ọ dịghị ana ụma site nʼaka ha. Ọ na-esite nʼihe ọjọọ sepụ aka ya, na-ekpekwa ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ na ibe ya.
EZE 18:9 Ọ na-edebezu iwu m niile, na-agbaso ụkpụrụ m niile nʼikwesị ntụkwasị obi. Onye ezi omume ka nwoke ahụ bụ; ọ ghaghị ịdịkwa ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 18:10 “Ọ bụrụ na o nwere nwa nwoke na-akpa ike, na-akwafu ọbara, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche,
EZE 18:11 ọ bụ ezie na nna ya emeghị ihe ndị a: “Ma ọ na-eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼugwu, na-emerụ nwunye onye agbataobi ya;
EZE 18:12 Ọ na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa. Ọ na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ọ dịghị eweghachi ihe o naara na mbe. Ọ na-efe arụsị, na-emekwa ihe arụ ndị ọzọ dị iche iche.
EZE 18:13 Ọ na-anara ndị ọ gbazinyere ego ọmụrụnwa na ụma. O kwesiri ka onye dị otu a dị ndụ? Ọ gaghị adị ndụ. Nʼihi na o meela ihe ndị a niile rụrụ arụ. A ga-egbu ya. Ọbara ya ga-adịkwa nʼisi ya.
EZE 18:14 “Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ.
EZE 18:15 “Ọ dịghị eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼelu ugwu maọbụ welie anya lee arụsị niile nke Izrel. Ọ dịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya.
EZE 18:16 Ọ dịghị emegbu onye ọbụla, maọbụ anara ihe mbe nʼihi ego ọ gbazinyere mmadụ. Ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike, kama na ọ na-enye ndị agụ na-agụ ihe oriri ya, na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi;
EZE 18:17 ọ bụrụ na ọ dịghị etinye aka na mmehie ọbụla, na ọ naghị anara ọmụrụnwa na ụma nʼaka ndị o binyere ego, na ọ na-erubekwara iwu m niile isi, na-agbaso ụkpụrụ m niile. Onye dị otu a agaghị anwụ nʼihi mmehie nke nna ya mere. Ọ ga-adị ndụ.
EZE 18:18 Ma nna ya ga-anwụ nʼihi mmehie niile o mere, nʼihi na ọ bụ onye na-ewe ihe na-abụghị nke ya, onye na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere nʼike. Ọ bụkwa onye na-eme ihe ọjọọ dị iche iche nʼetiti ndị ya.
EZE 18:19 “Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị mere nwa adịghị eketa oke nʼahụhụ nke ajọ omume nna ya?’ Ihe dị otu ahụ apụghị ime, ebe ọ bụ na nwa ya emeela ihe ziri ezi ma leziekwa anya debezuo ụkpụrụ m niile, ọ ghaghị ịdị ndụ.
EZE 18:20 Onye ahụ mere mmehie bụ onye ga-anwụ. Nwa agaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nna ya metara, nna agakwaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nwa ya metara. Onye ezi omume ga-anata ụgwọ ezi omume o mere, ma onye ajọ omume ga-anata ụgwọ nʼihi ajọ ihe o mere.
EZE 18:21 “Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite na mmehie niile o mere chigharịa, malite idebe ụkpụrụ m niile, ma na-emekwa ihe ziri ezi na nke dị mma, onye ahụ aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ.
EZE 18:22 Ọ dịghị ajọ omume niile bụ nke ha mere a ga-echeta megide ha. Ha ga-adị ndụ nʼihi ihe ezi omume ha mere.
EZE 18:23 Ọ na-atọ m ụtọ bụ ọnwụ nke ndị ajọ omume? Ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Kama, ọ bụghị mgbe ha si nʼụzọ ha chigharịa, dịrị ndụ, ka obi na-atọ m ụtọ?
EZE 18:24 “Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa, mee mmehie na-emekwa ihe arụ nke ndị ajọ mmadụ na-eme, ha ọ ga-adị ndụ? Mba! Ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha, ha bụ ndị ikpe mara, nʼihi mmehie ndị ha mere, ha ga-anwụ.
EZE 18:25 “Ma unu na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel. Ọ bụ nʼụzọ m ezighị ezi? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi?
EZE 18:26 Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime mmehie, ọ ga-anwụ maka ya; nʼihi mmehie ahụ o mere ka ọ ga-anwụ.
EZE 18:27 Ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume niile nke o mere chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-azọpụta ndụ ya.
EZE 18:28 Nʼihi na ọ tuleela nʼobi ya, kpebiekwa ịhapụ mmehie ya niile, ma malite ibi ndụ ziri ezi. Ndụ ga-abụ nke ya. Ọ gaghị anwụ.
EZE 18:29 Ma ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Ọ bụ nʼụzọ m niile ezighị ezi, unu ụlọ Izrel? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi?
EZE 18:30 “Ya mere, unu ụlọ Izrel, aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. Chegharịanụ, sitenụ na njehie unu niile unu chigharịa, mgbe ahụ, mmehie agaghị a bụrụ unu ihe ịsọ ngọngọ.
EZE 18:31 Wezuganụ njehie niile unu jehiere nʼime ya, ka unu nweta obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ. Ụlọ Izrel, gịnị mere unu ga-eji nwụọ?
EZE 18:32 Nʼihi na ọ dịghị atọ obi m ụtọ ịhụ na onye ọbụla na-anwụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Chegharịakwanụ, ka unu dịrị ndụ!
EZE 19:1 “Ma gị onwe gị, bụọrọnụ ndịisi Izrel abụ akwa a,
EZE 19:2 ma kwuo, “ ‘Ụdị nne Ọdụm gịnị ka nne gị bụ nʼetiti ụmụ ọdụm. Ọ dinara nʼetiti ha, na-azụ ụmụ ya.
EZE 19:3 Ọ zụlitere otu nʼime ụmụ ya nke ghọrọ nwa ọdụm siri ike. Ọ mụtakwara ka e si adọrisi anụ ọhịa, ghọọ ọdụm na-eri mmadụ.
EZE 19:4 Mba niile nụrụ maka ihe banyere ya, mee ka ọ danye nʼolulu ha gwuru. Ha ji nko koro ya, duru ya gaa nʼala Ijipt.
EZE 19:5 “ ‘Mgbe ọ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe ọzọ o nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ, matakwa na olileanya ya abụrụla ihe efu, ọ họpụtara nwa ya ọzọ kuziere ya otu ọ ga-esi bụrụ ọdụm dị ike.
EZE 19:6 Ọ ghọrọ onyeisi ụmụ ọdụm niile, nʼihi na ọ bụ ọdụm siri ike, ọ mụtakwara ka e si ejide anụ ọhịa, ya onwe ya ghọkwara ọdụm na-eri mmadụ.
EZE 19:7 O tikpọrọ ebe ha niile e wusiri ike meekwa obodo ha niile mkpọmkpọ ebe. Ala ahụ na ndị niile nọ nʼime ya, mara jijiji site nʼoke egwu nʼihi olu ịgbọ ụja ya.
EZE 19:8 Mgbe ahụ, ndị agha nke mba niile dị iche iche pụtara gbaa ya gburugburu. Ha sitere nʼakụkụ niile nwude ya nʼọnya olulu ha siiri ya.
EZE 19:9 Ha tinyere ya nko nʼimi, were dọkpuo ya nʼụlọ igwe a kpara akpa, bute ya nʼihu eze Babilọn. E mere ka o biri na mba ọzọ dịka ohu, ka a ghara ịnụ ụda olu ya ọzọ nʼugwu niile nke Izrel.
EZE 19:10 “ ‘Nne gị dịka osisi vaịnị nʼogige vaịnị a kụrụ nʼakụkụ mmiri, nke nwere ọtụtụ alaka, nke na-amịkwa mkpụrụ nʼihi mmiri ọ na-enweta.
EZE 19:11 Alaka ya niile siri ike, ha topụtara ghọọ mkpara eze. O topụrụ etopụ, tokarịa alaka ndị ọzọ elu. Nke a mere e ji na-ahụ ya anya site nʼebe dị anya.
EZE 19:12 Ma e ji oke iwe hopu ya tụpụ ya nʼala. Oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ mere ka akwụkwọ ya kpọnwụsịa, meekwa ka mkpụrụ ya daa. Alaka ya ndị ahụ dị ike kpọnwụsịrị, ọkụ rechapụkwara ha niile.
EZE 19:13 Ugbu a, akụọla ya nʼime ọzara ebe kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị.
EZE 19:14 Ọkụ esitela nʼogwe ya rechapụ alaka ya na mkpụrụ ya niile. Ọ dịkwaghị alaka siri ike fọdụrụ nke dịkwa mma ịbụ mkpara eze.’ Abụ a bụ abụ akwa, nke e kwesiri ịbụ mgbe ịkwa akwa.”
EZE 20:1 O ruo, nʼọgwụgwụ ọnwa ise, nʼafọ nke asaa, ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel bịara ịjụta Onyenwe anyị ase. Ha nọdụrụ ala nʼihu m.
EZE 20:2 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 20:3 “Nwa nke mmadụ, gwa ndị okenye Izrel okwu sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ajụ, Ọ bụ ịjụpụta ase nʼaka m ka unu bịara? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase ọbụla, ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’
EZE 20:4 “Ị ga-ekpe ha ikpe? Ị ga-ekpe ha ikpe, nwa nke mmadụ? Mee ka ha mara banyere ihe arụ niile nna nna ha mere.
EZE 20:5 Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼụbọchị m họpụtara Izrel, eweliri m aka m ṅụọrọ ya na ụmụ ya bụ ụlọ Jekọb iyi ma kpugheekwa onwe m gosi ha nʼala Ijipt. Site nʼiweli aka m, agwara m ha okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.”
EZE 20:6 Nʼụbọchị ahụ, aṅụụrụ m ha iyi na m ga-esi nʼala Ijipt dupụta ha baa nʼala nke m chọpụtara ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, bụ ala nke kachasị ibe ya mma.
EZE 20:7 Mgbe ahụ, agwara m ha, “Onye ọbụla nʼime unu, wezuganụ oyiyi ihe arụ niile ndị ahụ bụ nke unu legidere anya, unu ejikwala arụsị niile nke Ijipt merụọ onwe unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.”
EZE 20:8 “ ‘Ma ha nupuru isi megide m. Ha aṅaghị m ntị. Ha ewezugakwaghị oyiyi ihe arụ ndị a, bụ nke ha lekwasịrị anya, maọbụ hapụkwanụ arụsị niile nke ndị Ijipt. Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha oke iwe m, meekwa ka iwe m zuo oke nʼahụ ha nʼIjipt.
EZE 20:9 Ma nʼihi aha m, e si m Ijipt kpọpụta ha. E mere m nke a ka a ghara imerụ aha m bụ nke dị nsọ, nʼanya ndị mba dị iche iche nʼetiti ndị ha binyere, bụ ndị mkpughere onwe m nye Izrel nʼihu ha.
EZE 20:10 Nʼihi ya, esitere m nʼIjipt dupụta ha, dubata ha nʼọzara.
EZE 20:11 Nʼebe ahụ ka m nọ nye ha iwu m niile, gosikwa ha ụkpụrụ m, gwa ha na onye ọbụla debere ha ga-adị ndụ.
EZE 20:12 Ọzọ, e nyekwara m ha ụbọchị izuike, ka ọ bụrụ ihe ịrịbama dị nʼetiti mụ na ha, ka ha maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-edo ha nsọ.
EZE 20:13 “ ‘Ma ụlọ nke Izrel nupuru isi megide m. Nʼime ọzara ahụ, ha jụrụ idebe iwu m. Ha agbasoghị usoro m, ọ bụ ezie na ịgbaso ya pụtara ịdị ndụ. Ha edebeghị ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi ya, ekpebikwara m na m ga-awụkwasị ha iwe ọkụ m, ka m kpochapụ ha nʼime ọzara.
EZE 20:14 Ma nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha.
EZE 20:15 Ma nʼime ọzara ahụ, eweliri m aka ṅụọrọ ha iyi na m agaghị eduba ha nʼala ahụ m nyere ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ala ahụ kachasị ala niile ọzọ dị nʼụwa mma.
EZE 20:16 Nʼihi na ha jụrụ iwu m, ha jụkwara ịgbaso ụkpụrụ m niile. Ha merụrụ ụbọchị izuike m, nʼihi na obi ha niile dị nʼebe arụsị ha dị.
EZE 20:17 Ma eji m obi ebere lee ha anya ma ghara ịla ha nʼiyi. Ekpochapụghị m ha nʼọzara.
EZE 20:18 Mgbe ahụ, agwara m ụmụ ha okwu nʼọzara, “Unu agbasola nzọ ụkwụ nna unu ha maọbụ debe iwu ha maọbụ jiri arụsị ha merụọ onwe unu.
EZE 20:19 Mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke gị. Gbasoonụ iwu m niile, lezie anya ka ị sorokwa ụzọ m niile.
EZE 20:20 Doonụ ụbọchị izuike m nsọ, ka ha ghọọkwa ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke unu.”
EZE 20:21 “ ‘Ma ụmụ ahụ nupuru isi megide m. Ha ejegharịghị nʼụkpụrụ m, ha elezighị anya ka ha debe iwu nke m kwuru banyere ha, “Na onye ọbụla na-erubere ha isi ga-adị ndụ site na ha,” ha merụrụ ụbọchị izuike m. Nʼihi ya, asịrị m, Aga m awụkwasị ha ọnụma m, mezuokwa iwe m megide ha nʼọzara.
EZE 20:22 Ọzọkwa, eseghachiri m aka m, nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha
EZE 20:23 E jikwa m iweli aka elu ṅụọrọ ha iyi nʼime ọzara, na m ga-achụsasị ha nʼetiti mba niile, mee ka ha gbasaa nʼakụkụ niile nke ụwa,
EZE 20:24 nʼihi na ha edebeghị iwu m, kama ha jụrụ ụkpụrụ niile, lelịa ma merụọkwa ụbọchị izuike m. Naanị ihe na-agụ ha bụ arụsị niile nke nna ha.
EZE 20:25 Ahapụrụ m ha ka ha nabatara onwe ha iwu na omenaala dị iche iche nke na-abaghị uru. Nʼihi na site nʼidebe omenaala ndị a, ha apụghị inweta ndụ.
EZE 20:26 E merụrụ ha site nʼonyinye ha, bụ, iji nwa mbụ ọbụla chụọ aja, ka m si otu a menye ha egwu ka ha mara na mụ onwe m bụ Onyenwe.’
EZE 20:27 “Ya mere, nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel okwu, sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Nna unu ha kwuluru m na nke a, site na-ekwesighị ntụkwasị obi nye m.
EZE 20:28 Mgbe m dubatara ha nʼala ahụ nke m ṅụrụ nʼiyi inye ha, ha hụrụ ugwu dị elu maọbụ osisi nwere ọtụtụ akwụkwọ, ebe ahụ ha chụrụ aja ha, nyekwa onyinye ha, si otu a kpasuo m iwe. Ha doro ha ihe ndị ahụ niile na-esi isi ụtọ, wụsakwara ha aja ihe ọṅụṅụ
EZE 20:29 Ya mere a jụrụ m ha, Gịnị ka a na-akpọ ebe ịchụ aja a unu na-aga?’ ” (A na-akpọ ya Baama ruo taa.)
EZE 20:30 “Nʼihi nke a, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Unu ọ ga-emerụ onwe unu dịka nna nna unu ha mere site nʼịchụso oyiyi ihe arụ ha dị iche iche?
EZE 20:31 Mgbe unu na-enye onyinye unu, na-eme ka ụmụ unu site nʼọkụ gafee, unu na-aga nʼihu jiri arụsị unu niile na-emerụ onwe unu ruo taa. Mụ onwe m, m ga-ekwe ka unu jụta m ase, O ụlọ Izrel? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase.
EZE 20:32 “ ‘Unu na-ekwu nʼobi unu sị, “Anyị chọrọ ịdị ka mba ndị ọzọ, dịka agbụrụ ndị ọzọ nọ nʼụwa, ndị na-akpọ isiala nye osisi na nkume.” Ma ihe unu bu nʼobi agaghị emezu.
EZE 20:33 Dịka m na-adị ndụ, aga m eji aka ike na ogwe aka e setịrị eseti nakwa nwụpụ nke oke iwe m chịa unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
EZE 20:34 Aga m akpọpụta unu site na mba dị iche iche, chịkọtaa unu site na mba ndị ahụ a chụsasịrị unu. Ọ bụ aka m dị ike, aka m setịpụrụ na ọnụma a wụpụrụ ka m ga-eji mee ya.
EZE 20:35 Aga m akpọbata unu nʼọzara nke mba niile, nọdụ nʼebe ahụ kpee unu ikpe nʼihu nʼihu.
EZE 20:36 Dịka m kpere nna nna unu ha ikpe nʼọzara nke dị nʼala Ijipt, otu a ka m ga-esi kpee unu ikpe, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 20:37 Aga m eme ka unu si nʼokpuru mkpanaka m gafee, aga m akpọbata unu na njikọ nke ọgbụgba ndụ ahụ.
EZE 20:38 Aga m esi nʼetiti unu wezuga ndị na-ekwe ntị ike ma na-enupu isi megide m. Ọ bụ ezie na m ga-akpọpụta ha site nʼala ahụ ha bi, ma ha agaghị abata nʼala Izrel. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 20:39 “ ‘Ma banyere unu, bụ ụlọ Izrel, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gaanụ fee arụsị unu niile dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu. Ma emesịa, unu aghaghị ịṅa m ntị, ọ dịghịkwa mgbe unu ga-eji onyinye na arụsị unu niile merụọ aha nsọ m.
EZE 20:40 Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu m dị nsọ, nke bụ elu ugwu ukwu nke Izrel, ka Izrel niile ga-anọ fee m. Nʼebe ahụ ka m ga-anọkwa nabata onyinye unu na onyinye pụrụ iche unu, na aja nsọ unu dị iche iche. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 20:41 Aga m anabatakwa unu dịka onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, mgbe m si na mba dị iche iche kpọlata unu, mgbe m ga-achịkọta unu site nʼobodo ahụ niile a chụgara unu. Mgbe ahụ, mba niile ga-amata na m dị nsọ.
EZE 20:42 Mgbe m mere ka unu lọta nʼala Izrel, bụ ala ahụ m weliri aka elu ṅụọ iyi inye nna nna unu ha, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 20:43 Nʼebe ahụ, unu ga-echeta obibi ndụ na omume mmehie niile unu ji merụọ onwe unu. Unu ga-asọkwa onwe unu oyi, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere.
EZE 20:44 Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesochara unu mmeso nʼihi aha m, na-agụghị ajọ omume unu maọbụ otu ụzọ ọjọọ niile unu si dị, unu bụ ụlọ Izrel. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.’ ”
EZE 20:45 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 20:46 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ ndịda. Kwuokwa okwu megide ala ahụ dị na ndịda, na oke ọhịa niile dị na ndịda.
EZE 20:47 Sị oke ọhịa ndịda ahụ, ‘Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ana m akwado isunye gị ọkụ, nke ga-erechapụ osisi niile dị nʼime gị, ma ndị dị ndụ ma ndị kpọnwụrụ akpọnwụ. A pụghị imenyụ oke ọkụ ahụ, ọ ga-erechapụkwa ihu niile site na ndịda ruo nʼugwu niile.
EZE 20:48 Ihe niile bụ mmadụ, ga-ahụ na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, sunyere ọkụ ahụ. A gaghị emenyụkwa ya.’ ”
EZE 20:49 Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ha na-ekwu banyere m, sị, ‘Ọ bụghị naanị ilu ka ọ na-atụ?’ ”
EZE 21:1 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 21:2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ Jerusalem, buo amụma megide ụlọnsọ ukwu ahụ. Bukwaa amụma megide ala Izrel
EZE 21:3 sị ala Izrel otu a, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Mụ onwe m na-emegide gị. Aga m esite nʼọbọ mịpụta mma agha m, site na gị gbuchapụ ma onye ezi omume na onye ajọ omume.
EZE 21:4 Nʼihi na m na-aga igbuchapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume, mma agha m ga-esite nʼọbọ ya pụta megide onye ọbụla site nʼugwu ruo na ndịda.
EZE 21:5 Mgbe ahụ, mmadụ niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị amịpụtala mma agha m site nʼọbọ ya, ọ gaghị amịghachi baa nʼọbọ ọzọ.’
EZE 21:6 “Nʼihi ya, sụọ ude, nwa nke mmadụ, sụọ ude nʼihu ha nʼọnọdụ oke mwute na obi mgbawa.
EZE 21:7 Mgbe ha jụrụ gị, ‘Gịnị kpatara i ji asụ ude?’ Ị ga-asị, ‘Nʼihi ozi nke na-abịa. Obi niile ga-agbaze site nʼegwu, aka niile ga-akụdakwa; mmụọ niile ga-ada mba, ikpere niile ga-ede mmiri site nʼamịrị.’ Ọ na-abịa, ọ ghaghị imezu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
EZE 21:8 Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 21:9 “Nwa nke mmadụ buo amụma sị, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Lee, mma agha, lee, mma agha, a mụọla ya, hichakwaa ya.
EZE 21:10 Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị, hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma. “ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya.
EZE 21:11 “ ‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ, ka e jidekwa ya nʼaka. A mụọla ya, hichazie ya. E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi.
EZE 21:12 Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike, nʼihi na ọ bụ megide ndị m ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile. A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha, ha na ndị m. Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.
EZE 21:13 “ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’
EZE 21:14 “Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ. Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ, ka mma agha gbuo ugboro abụọ e, ọ bụladị ugboro atọ. Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu, nke e debere maka oke ogbugbu nke ga-abịachibido ha gburugburu.
EZE 21:15 Ka obi ha gbazee site nʼegwu, ka ndị na-ada ada hie nne, nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niile maka oke ogbugbu. Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma, etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu.
EZE 21:16 Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla, ma ọ nọ gị nʼaka nri ma ọ nọ gị nʼaka ekpe.
EZE 21:17 Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m, ime ka iwe m jụrụ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”
EZE 21:18 Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 21:19 “Nwa nke mmadụ mee ụzọ abụọ nke mma agha eze Babilọn ga-eso. Ka ụzọ abụọ ndị a malite nʼotu obodo. Dee ihe ngosi manye ha nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ.
EZE 21:20 Mee ka otu nʼime ụzọ ndị ahụ bụrụ ebe mma agha ga-esi bịa megide Raba nke Amọn, ka nke ọzọ megide Juda na Jerusalem, bụ ebe e wusiri ike.
EZE 21:21 Nʼihi na eze Babilọn ga-abịa guzo nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ, nʼisi ụzọ abụọ ahụ ịchọ ihe ama. Ọ ga-esite nʼịgba àkụ nke ife nza, jụọ ase site nʼaka arụsị ya niile, nyochakwaa umeju ahụ.
EZE 21:22 Nʼụzọ dị nʼaka nri, ka ihe ịjụ ase banyere Jerusalem ga-esi bịa. Nʼebe ahụ ka ọ ga-ewu ihe niile ha ji etida mgbidi obodo ahụ. Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ nye iwu maka igbuchapụ ndị niile, na iwu ido ihe e ji etipu mgbidi nʼọnụ ụzọ ama niile, na iwu a ga-eji wuo nkwasa agha na mgbidi e ji ebuso ya agha.
EZE 21:23 Ọ ga-adị ha dịka ọjụjụ ase nke na-abaghị uru, nye ndị ahụ ṅụrụ ha iyi, ma ọ ga-echetara ha ihe ọjọọ ha mere, dọkpụrụ ha nʼike.
EZE 21:24 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. ‘Ebe ọ bụ na unu esitela na nnupu isi unu mee ka e cheta ajọ omume unu, si otu a na-ekpughe mmehie unu nʼihe niile unu na-eme. Ebe ọ bụ na unu emeela ihe dị otu a, a ghaghị ịdọta unu nʼagha.
EZE 21:25 “ ‘Gị onye rụrụ arụ, onye na-emebi iwu, gị nwa eze nʼIzrel, gị onye ụbọchị ahụhụ ya rurula,
EZE 21:26 ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu.
EZE 21:27 Mbibi, mbibi. Aga m eme ka ọ ghọọ ihe e bibiri ebibi. A gaghị eweghachikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe onye ahụ o ruuru nʼizi ezi bịara. Ya ka m ga-enyefe ya nʼaka.’
EZE 21:28 “Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha: “ ‘Lee mma agha, lee mma agha, nke a mịpụtara maka oke ogbugbu. E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa, ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe.
EZE 21:29 Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu, na a jụtakwala ase ụgha banyere unu, a ga-etinye ya nʼolu ndị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu, bụ ndị ụbọchị ha rurula, ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara.
EZE 21:30 “ ‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya. Nʼebe ahụ e kere unu nʼala nna nna unu ha, Aga m ekpe unu ikpe.
EZE 21:31 Aga m awụkwasị unu ọnụma m, kukwasịkwa unu ikuku nke oke iwe m. Aga m ewere unu nyefee nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị bụ ọka na ịla mmadụ nʼiyi.
EZE 21:32 Unu ga-aghọkwa mmanụ a na-awụnye nʼọkụ. A ga-awụsịkwa ọbara unu nʼala unu. Ọ dịkwaghị onye ga-echeta unu ọzọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.’ ”
EZE 22:1 Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị:
EZE 22:2 “Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe ya ikpe? Ị ga-ekpe obodo ọbara a ikpe? Mgbe ahụ, ị ga-eguzogide ya ihu nʼihu mee ka ọ mara ihe arụ niile o mere.
EZE 22:3 ‘Ị ga-asị, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gị obodo nke na-ewetara onwe gị mbibi nʼihi ọbara niile a na-awụsi nʼetiti gị, na arụsị niile i ji na-emerụ onwe gị.
EZE 22:4 Lee ka i si bụrụ onye ikpe mara nʼihi ọbara ị wụsiri. Leekwa ka i si bụrụ onye e merụrụ emerụ site nʼarụsị niile ị kpụrụ. I jirila aka gị mee ka ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị abịala nʼezie. Nʼihi ya, aga m eme gị ka ị bụrụ ihe nkọcha nye mba niile, na ihe ịkwa emo nye mba dị iche iche.
EZE 22:5 Ndị nọ gị nso na ndị nọ gị ebe dị anya ga-achị gị ọchị, gị obodo rụrụ arụ, na nke jupụtara nʼọgbaaghara.
EZE 22:6 “ ‘Lee ka ndịisi Izrel nọ nʼime gị si e ji ike ha nwere na-awụsi ọbara.
EZE 22:7 A na-elelị nne na nna nʼime gị. Ndị mbịarambịa ka e ji anya ike na-emegbu. Ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ ka a na-akpagbu, na-emejọkwa.
EZE 22:8 I lelịala ihe nsọ m niile, merụọkwa ụbọchị izuike m niile.
EZE 22:9 Ndị nkwutọ, ndị na-awụsi ọbara nọ nʼime gị. Ndị na-eri nri nʼihu arụsị niile dị nʼelu ugwu, na ndị na-eme omume rụrụ arụ nọkwa nʼime gị.
EZE 22:10 Nʼime gị ka ndị na-akwaso nwunye nna ha iko dị, nʼime gị ka ndị na-awakpo ụmụ nwanyị mgbe ha nọ na nsọ ha, bụ mgbe ha nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha.
EZE 22:11 Nʼime gị ka otu nwoke na-eme ihe arụ ya na nwunye onye agbataobi ya, onye ọzọ na-enweghị ihere emerụọla nwunye nwa ya, onye ọzọkwa, emerụkwala nwanne ya nwanyị, bụ ada nke nna ya mụrụ.
EZE 22:12 E nwekwara ndị na-anara ego gbuo mmadụ ibe ha nʼime gị. Gị onwe gị na-anarakwa ndị i binyere ego ụma buru ibu, na-esitekwa nʼaka ike na-anara ndị mmadụ ihe ha. I chefuokwala m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 22:13 “ ‘Lee, aghaghị m ịkụkọta ọbụ aka m abụọ nʼihi uru nke na-ezighị ezi ị na-eri, na ọbara niile nke ị wụsiri nʼetiti gị.
EZE 22:14 Obi gị ọ ga-esikwa ike? Ị ga-eguzokwa nʼụbọchị m ga-ekpe gị ikpe? Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola. Aga m emezukwa ya.
EZE 22:15 Aga m achụsa unu nʼetiti mba niile, fesaa unu nʼetiti mba niile. Aga m emekwa ka adịghị ọcha unu kwụsị.
EZE 22:16 Mgbe e mere ka ị ghara ịdị nsọ nʼanya ndị mba dị iche iche, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
EZE 22:17 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 22:18 “Nwa nke mmadụ, ụlọ Izrel aghọọlara m ihe efu. Ha niile aghọọla ọla, na gbamgbam, na igwe, na ọla opu a hapụrụ nʼọkụ. Ha bụ nnọọ ihe efu nke ọlaọcha.
EZE 22:19 Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: ‘Nʼihi na unu niile aghọọla ihe efu, aga m achịkọta unu nʼime Jerusalem.
EZE 22:20 Dịka a na-achịkọta ọlaọcha, na ọla, na igwe, na opu, na gbamgbam, tinye ha nʼoke ọkụ ka ha gbazee, otu a ka m ga-esite nʼiwe m na ọnụma m chịkọtaa unu nʼime obodo ahụ gbazee unu.
EZE 22:21 Aga m achịkọta unu, fụkwasị unu ọkụ nke ọnụma m, mee ka unu gbazee nʼime ya.
EZE 22:22 Dịka ọlaọcha si agbaze nʼọkụ, otu a ka unu ga-esi gbazee nʼime ya. Unu ga-amatakwa nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị awụkwasịla unu iwe m.’ ”
EZE 22:23 Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 22:24 “Nwa nke mmadụ, gwa ala ahụ okwu, ‘Ị bụ ala nke a na-emebeghị ka ọ dị ọcha, maọbụ mmiri izokwasị ya nʼụbọchị ọnụma.’
EZE 22:25 E nwere izuzu ọjọọ nke ndị ụmụ eze nọ nʼime ya, dịka ọdụm nke na-agbọ ụja na-adọgbu anụ ọ na-eri eri, ha na-eripịa ndị mmadụ. Ha ewerela akụ ha na ihe ha niile dị oke ọnụahịa, mekwa ka ụmụ nwanyị na-enweghị di baa ụba nʼetiti ya.
EZE 22:26 Ndị nchụaja ya na-enupu isi nʼiwu m niile, mee ka ihe nsọ m niile gharakwa ịdị nsọ, nʼebe nsọ m. Ha adịghị akpakwa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ. Ha na-ezi ndị m na ihe dị iche ọbụla adịghị nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha. Ha adịghị akpọkwa ụbọchị izuike m ihe ọbụla. Nʼihi ya, e mere ka m ghara ịdịkwa nsọ nʼetiti ha.
EZE 22:27 Ndịisi nọ nʼime gị dịka nkịta ọhịa na-adọgbu anụ o gbutara. Ha na-awụsi ọbara, ime ka mkpụrụobi mmadụ laa nʼiyi nʼihi uru akpa ha.
EZE 22:28 Ndị amụma ha eteela nzu nʼọrụ ha niile site nʼọhụ ụgha nʼịgba afa ụgha mgbe ha na-ahụghị ọhụ ọbụla. Ha na-asị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,’ mgbe Onyenwe anyị na-ekwughị ihe ọbụla.
EZE 22:29 Ndị ala a na-eji aka ike na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere na-ezukwa ohi. Ha na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, na-emegbukwa ndị ọbịa site nʼụzọ ekpeghị ikpe ziri ezi.
EZE 22:30 “Achọrọ m otu onye nʼetiti ha bụ onye nke ga-ewuzi mgbidi ogige, guzokwa nʼihu m ikwuchite ọnụ ala a, ka m ghara ịla ala a nʼiyi, ma ọ dịghị onye m hụrụ.
EZE 22:31 Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha ọnụma m, jirikwa iwe m dị ọkụ rechapụ ha. Aga m ebokwasịkwa ahụhụ niile nke mmehie ha, nʼisi ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
EZE 23:1 Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị m,
EZE 23:2 “Nwa nke mmadụ, ọ dị ndị inyom abụọ nke otu nne mụrụ.
EZE 23:3 Ha ghọrọ ndị akwụna nʼala Ijipt site na mgbe ha bụ agbọghọ. Nʼala ahụ, a bịagidere ara ha aka, pịakwa ọnụ ara agbọghọ ha aka nʼọnọdụ igwuri egwu.
EZE 23:4 Aha nke okenye bụ Ohola. Aha nwanne ya nwanyị bụ Oholiba. Ha bụrịị nkem, ha mụtakwara m ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyị. Ohola bụ Sameria, Oholiba bụkwa Jerusalem.
EZE 23:5 “Ohola na-agba akwụna mgbe ọ ka bụ nkem. O nwere agụụ ịkwa iko nʼebe ndị niile ọ hụrụ nʼanya nọ, bụ ndị dike nʼagha nke ndị Asịrịa,
EZE 23:6 ndị yi uwe anụnụ, ndịisi ọchịchị na ndị ọchịagha, ha niile bụ ụmụ okorobịa mara mma nʼile anya, na ndịisi agha, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya.
EZE 23:7 O weere onwe ya nyefee nʼaka ndị ikom Asịrịa ogugo ha kachasị elu dịka onye akwụna, merụọkwa onwe ya site nʼife arụsị dị iche iche nke onye ọbụla agụụ ya gụrụ obi ya.
EZE 23:8 Ma ọ hapụghị mmụọ akwụna ahụ dị nʼime ya, bụ nke o bidoro nʼIjipt, nke bụ na mgbe ọ bụ agbọghọ ya na ndị ikom dinakọrọ, ha na-apịkwa ọnụ ara agbọghọ ya aka, na-awụkwasịkwa agụụ nke ọchịchọ ọjọọ ha nʼahụ ya.
EZE 23:9 “Nʼihi nke a enyefere m ya nʼaka ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, bụ ndị Asịrịa, ndị agụụ ha na-agụ ya.
EZE 23:10 Ha gbara ya ọtọ, ha kpọọrọ ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, ma ya onwe ya ka ha were mma agha gbuo. Nʼụzọ dị otu a, ọ ghọrọ ihe akụkọ ilu nʼetiti ndị inyom niile, a takwara ya ahụhụ.
EZE 23:11 “Oholiba bụ nwanne ya nwanyị hụrụ ihe ndị a, ma nʼime agụụ ihe ọjọọ nke gụrụ ya nakwa ịgba akwụna, ọ kpara agwa jọrọ njọ karịa nke nwanne ya nwanyị.
EZE 23:12 Ya onwe ya kwa, agụụ ụmụ Asịrịa gụrụ ya, bụ ndịisi ọchịchị, na ndị ọchịagha, ndị dike nʼagha yi uwe agha dịka o kwesiri, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya, ha niile bụ ụmụ okorobịa dị mma nʼile anya.
EZE 23:13 Ahụrụ m na ya onwe ya merụkwara onwe ya; ha abụọ si otu ụzọ aga.
EZE 23:14 “O gara nʼihu tụkwasị ihe nʼịgba akwụna ya karịa. Ọ hụrụ onyinyo ndị ikom atụnyere nʼahụ aja, bụ onyinyo nke ndị Kaldịa e ji ihe chara uhie uhie sepụta,
EZE 23:15 ha kere ihe okike nʼukwu ha nakwa akwa okike nʼisi ha; nʼile anya ha niile dịka ndịisi ụgbọ agha ndị Babilọn, Kaldịa bụ ala amụrụ ha.
EZE 23:16 Ngwangwa ọ na-ele ha anya, agụ ha gụrụ ya, o zipụrụ ha ndị ozi na Kaldịa.
EZE 23:17 Mgbe ahụ ndị Babilọn bịakwutere ya, nʼelu ihe ndina ịhụnanya, nʼime agụụ nke anụ ahụ ha, ha merụrụ ya. Mgbe ha mesịrị ka ọ bụrụ ihe rụrụ arụ site nʼịkwa iko, o si nʼebe ha nọ wezuga onwe ya nʼọnọdụ ịsọ ha oyi.
EZE 23:18 Mgbe ọ gara nʼihu na-akwa iko nʼezoghị ezo na-ekpughekwa ọtọ ya, elepụrụ m ya anya nʼihi ịsọ oyi, dịka m mere lepụkwara anya site nʼebe nwanne ya nwanyị nọ.
EZE 23:19 Ma ọ gara nʼihu na-akwa iko karịa, dịka ọ na-echeta ndụ akwụna o biri nʼIjipt mgbe ọ bụ agbọghọ.
EZE 23:20 Nʼebe ahụ, agụụ ndị ikom ya na ha na-akwa iko gụrụ ya, bụ ndị anụahụ ha dịka nke ịnyịnya ibu, ndị ihe ha na-anyụpụta dịkwa ka nke ịnyịnya.
EZE 23:21 Ya bụ, na-agụụ ndụ ọjọọ nke i biri mgbe ị bụ agbọghọ na-agụsị gị ike, mgbe ị nọ nʼIjipt ebe a na-abịagide gị aka nʼara, ebe apịkwara ọnụ ara nta gị aka.
EZE 23:22 “Nʼihi nke a, gị Oholiba, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m akpali ndị ahụ hụrụ gị nʼanya megide gị, bụ ndị ahụ ihe ha na-amasịkwaghị gị ọzọ. Aga m esi nʼakụkụ niile kpọta ha, megide gị.
EZE 23:23 Ndị Babilọn, ndị Kaldịa niile, ndị ikom Pekod, ndị Shoa, na ndị Koa, na ndị Asịrịa niile ha na ha soo. Ụmụ okorobịa niile dị mma ile anya, ha niile bụ ndị na-achị achị na ndị ọchịagha, ndịisi na-agba ịnyịnya, na ndị ikom ọkwa ha dị elu, ha niile ga-anọkwasị nʼelu ịnyịnya.
EZE 23:24 Ha ga-eji ngwa agha dị iche iche, ụgbọala nke agha na ọtụtụ igwe ndị mmadụ dị iche iche; ha ji ọta ukwu na ọta nta, kpurukwa okpu agha igwe, were ọnọdụ gburugburu gị nʼakụkụ ọbụla, imegide gị. Aga m enyefe gị nʼaka ha, ka ha taa gị ahụhụ, ha ga-atakwa gị ahụhụ dịka usoro ikpe ha si dị.
EZE 23:25 Aga m edo ekworo nke iwe m megide gị, ha ga-eji iwe na ọnụma mesie gị ike. Ha ga-ebipụ imi unu na ntị unu, ndị fọdụkwara nʼime unu ga-anwụ site na mma agha. Ha ga-achịkọrọ ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom pụọ, unu ndị nke fọdụrụ ka ọkụ ga-erepịa.
EZE 23:26 Ha ga-eyipụ gị uwe ọma gị niile, chikọrọ ihe ịchọ mma gị niile.
EZE 23:27 Nʼụzọ dị otu a, a ga-eme ka agụ ọchịchọ ọjọọ nke anụahụ na ịkwa iko, bụ nke i bidoro nʼala Ijipt kwụsị. Ị gaghị enwekwa agụụ ile ihe ndị a niile anya maọbụ chetakwa Ijipt nʼuche gị.
EZE 23:28 “Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m aga iwere gị nyefee nʼaka ndị ahụ kpọrọ gị asị, bụ ndị ahụ ị wezugara onwe gị site nʼebe ha nọ nʼihi ịsọ oyi.
EZE 23:29 Ha ga-esite nʼịkpọ asị mesie gị ike, pụnara gị ihe niile i nwere nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ha. Ha ga-ahapụ gị ka ịgbara ọtọ ihu na azụ, mgbe ahụ ihere nke ịgba akwụna gị ga-apụta ihe. Agụụ nke ọchịchọ ọjọọ na ịkwa iko gị
EZE 23:30 emeela ka ihe ndị a bịakwasị gị, nʼihi na agụụ mmekọrịta nʼebe mba ndị ọzọ gụrụ gị, ị jikwa arụsị ha merụọ onwe gị.
EZE 23:31 Ị gbasoro nzọ ụkwụ nwanne gị nwanyị, nʼihi ya, aga m ewere iko ya tinye gị nʼaka.
EZE 23:32 “Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “Iko nwanne gị nwanyị ka ị ga-aṅụ bụ iko sara mbara ma dịkwa omimi; nke ga-eme ka ị ghọọ onye a na-achị ọchị na onye a na-akwa emo, nʼihi na ọ na-anagide ihe dị ukwuu.
EZE 23:33 Ị ga-ejupụta nʼịṅụbiga mmanya oke na iru ụjụ, nʼihi iko mbibi na ntikpọsi, bụ iko nke nwanne gị nwanyị bụ Sameria.
EZE 23:34 Ị ga-aṅụ ya, ṅụchaa ihe dị nʼiko ahụ. Ị ga-atapịakwa iberibe ya niile, dọkasịakwa ara gị abụọ. Ekwuola m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 23:35 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na i chefuola m, gbakụta m azụ gị, ị ga-ata ahụhụ niile ruuru gị nʼihi mmehie, agụụ ọchịchọ ọjọọ na ịgba akwụna gị.”
EZE 23:36 Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe Ohola na Oholiba ikpe? Mgbe ahụ, guzogide ha mee ka ha mara ihe arụ niile ha na-eme.
EZE 23:37 Nʼihi na ha akwaala iko, ọbara jupụtakwara nʼaka ha, ha na arụsị ha kwakwara iko. Ha jikwa ọ bụladị ụmụ nke ha mụtaara m chụọ aja nsure ọkụ nye ha.
EZE 23:38 Ihe ọzọ ha mere m bụ nke a: Ha merụrụ ebe nsọ m nʼotu ụbọchị ahụ ha mere ka ụbọchị izuike m gharakwa ịdị nsọ.
EZE 23:39 Nʼihi na nʼotu ụbọchị ahụ ha ji ụmụ ha chụọ aja nye arụsị ha, bụkwa ụbọchị ha batara nʼụlọnsọ m merụọ ya. Ihe dị otu a ka ha mere nʼụlọnsọ m.
EZE 23:40 “Ọ bụghị naanị nke a, ha zigara ndị ozi ịkpọ ndị ikom na-esi ebe dị anya bịa, mgbe ha bịara, nʼihi ha, ị sachara ahụ gị nke ọma, tee ihe nʼanya gị, yirikwa ezigbo ihe ịchọ mma gị.
EZE 23:41 Ị nọdụrụ nʼelu ihe ndina e doziri nke ọma, na tebul e doro nʼusoro dịkwa nʼihu ya nke ị dọbara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na mmanụ oliv bụ nke m nʼelu ya.
EZE 23:42 “Olu igwe mmadụ ndị obi dị ụtọ na-ada gburugburu ya nʼime ụlọ, e sitekwara nʼọzara bubata ndị ṅụbigara mmanya oke, ha na ọtụtụ ndị ọzọ, Ha gbanyekwara nwanyị a na nwanne ya nwanyị mgbaaka na nkwoji aka ha, yinyekwa ha okpueze mara mma nʼisi.
EZE 23:43 Mgbe ahụ, ihe m kwuru banyere nwanyị ahụ ịkwa iko riri ahụ bụ nke a, ‘Ugbu a, ka ha mesoo ya mmeso dịka onye na-agba akwụna, nʼihi na nke ahụ ka ọ bụ.’
EZE 23:44 Ha bara dinakwuru ya. Dịka ndị ikom si abakwuru nwanyị akwụna, otu a ka ha si bakwuru ụmụ nwanyị ndụ ọjọọ a bụ Ohola na Oholiba.
EZE 23:45 Ma ndị ikpe ezi omume ga-ama ha ụdị ikpe a na-ama ndị inyom na-akwa iko na ndị na-awụsikwa ọbara. Nʼihi na ha bụ ndị na-akwa iko, na ndị ọbara dị nʼaka ha.
EZE 23:46 “Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m akpọkọta igwe ndị mmadụ ga-emegide ha, nyefee ha nʼaka oke ihe egwu, nakwa ihe nlụta nʼagha.
EZE 23:47 Mkpọkọta mmadụ ahụ ga-atụ ha nkume, werekwa mma agha gbudasịa ha. Ha ga-egbu ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, kpọkwaa ụlọ ha niile ọkụ.
EZE 23:48 “Otu a, aga m eme ka ibi ndụ ọjọọ kwụsị nʼala ahụ, ka esi otu a adọ ndị inyom niile aka na ntị, ka ha hapụ ịgbaso nzọ ụkwụ gị.
EZE 23:49 Ị ghaghị ịta ahụhụ nʼihi ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị, hụkwaa ahụhụ nʼihi mmehie niile nke ịkpọ isiala nye arụsị. Mgbe ahụ ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.”
EZE 24:1 O ruo nʼafọ nke itoolu, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 24:2 “Nwa nke mmadụ, detuo ụbọchị taa nʼakwụkwọ, nʼihi na ọ bụ taa ka eze Babilọn gbara Jerusalem gburugburu.
EZE 24:3 Ugbu a, tụọrọ ndị a na-enupu isi ilu a, gwa ha: ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Sikwasịnụ ite ahụ nʼọkụ; sikwasị ya kunyekwanụ mmiri nʼime ya.
EZE 24:4 Tinyenụ anụ a bọrọ abọ nʼime ya. Tinye anụ dị mma, apata ya na aka ya. Tinyekwa ọkpụkpụ ndị ahụ dị mma nʼime ya.
EZE 24:5 Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ, kwajuokwa nkụ nʼokpuru ya maka ọkpụkpụ ndị ahụ, mee ya ka ọ gbọọ nke ọma, sie ọkpụkpụ ndị ahụ nʼime ya.
EZE 24:6 “ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya. E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya, nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya. Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu. Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a.
EZE 24:7 “ ‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya. Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya. Ọ bụghị nʼelu ala efu, ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya.
EZE 24:8 Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume, ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya.
EZE 24:9 “ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara. Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ.
EZE 24:10 Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu, mụnyekwanụ ọkụ. Jirinụ ụda dị iche iche sizie anụ ahụ nke ọma; surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ.
EZE 24:11 Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ, tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa, gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị, nchara ya ga-agwụsịkwa.
EZE 24:12 Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ. Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya emeghị ka ọ gbazee.
EZE 24:13 “ ‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke.
EZE 24:14 “ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Oge m ji emezu ihe m kwuru eruola. Agaghị m ahapụ imezu ya. Agaghị m eme ebere maọbụ weghachi aka m azụ. A ga-ekpe gị ikpe dịka omume na obibi ndụ gị si dị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
EZE 24:15 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 24:16 “Nwa nke mmadụ, ana m aga iwere ihe otiti napụ gị onye ahụ ihe ya na-atọ gị ụtọ. Ma mgbe o mere, ị gaghị eti aka nʼobi maọbụ kwaa akwa. Anya mmiri agakwaghị esi gị nʼanya pụta.
EZE 24:17 I nwere ike sụọ ude, ma asụsila ya ike. Ị gaghị eru uju nʼihi onye nwụrụ anwụ. Kechie isi gị, yirikwa akpụkpọụkwụ gị, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ na-eri.”
EZE 24:18 Agwara m ndị mmadụ okwu a nʼụtụtụ, ma nʼanyasị nwunye m nwụrụ. Nʼụtụtụ echi ya, emere m ihe niile dịka e siri nye m ya nʼiwu.
EZE 24:19 Mgbe ahụ, ndị mmadụ sịrị m, “Ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara? Gịnị mere iji eme omume dị otu a?”
EZE 24:20 Ya mere a sịrị m ha, “Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
EZE 24:21 Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha.
EZE 24:22 Mgbe ahụ, unu ga-eme dịka m mere. Unu agaghị ekpuchi egbugbere ọnụ unu, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ kwesiri iri.
EZE 24:23 Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu.
EZE 24:24 Izikiel ga-abụrụ unu ihe ịmaatụ. Unu ga-emekwa dịka o mere mgbe ihe ndị a mezuru. Unu ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.’
EZE 24:25 “Ma gị, nwa nke mmadụ, nʼụbọchị ahụ m napụrụ ha ebe ha siri ike, nke bụ ọṅụ ha na ebube ha, na ihe anya ha na-achọsi ike; na ihe na-atọ obi ha ụtọ, na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom,
EZE 24:26 nʼụbọchị ahụ, ọ bụ onye na-agba ọsọ ndụ ga-agbakwute gị ịkọrọ gị ihe mere.
EZE 24:27 Nʼoge ahụ, ị ga-asaghe ọnụ gị. Gị na onye ahụ na-agba ọsọ ndụ ga-ekwurịta okwu. Ị gaghị anọkwa juu ọzọ. Nʼihi ya, ị ga-aghọrọ ha ihe ịrịbama. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
EZE 25:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 25:2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼala ụmụ Amọn buo amụma megide ha.
EZE 25:3 Gwa ndị Amọn, ‘Nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na ị sịrị “Aha!” megide ebe nsọ m mgbe e merụrụ ya na megide ala Izrel, mgbe e mere ka ọ tọgbọrọ nʼefu, na mgbe a dọtara ndị Juda nʼagha duru ha gaa mba ọzọ dịka ohu,
EZE 25:4 nʼihi ya, aga m ewere gị nyefee nʼaka ndị si nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ị bụrụ ihe nketa ha. Ha ga-ewu ebe obibi nʼetiti gị, rie mkpụrụ ubi gị, ṅụọkwa mmiri ara ehi gị.
EZE 25:5 Aga m eme ka obodo Raba ghọọ ebe ịta nri nye ịnyịnya kamel, meekwa ka ala Amọn ghọọ ebe igwe ewu na atụrụ na-amakpu. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 25:6 Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Nʼihi na ị kụrụ aka gị, zọọ ụkwụ gị nʼala gidim, ma sitekwa nʼịkpọ asị nke obi gị ṅụrịa ọṅụ megide ala Izrel,
EZE 25:7 nʼihi ya, lee, aga m esetipụ aka m megide gị, were gị nyefee nʼaka ọtụtụ mba, ndị ga-alụta gị nʼagha. Aga m eme ka ị gwụsịa, mee ka ị hapụ ịdịkwa ọzọ. Aga m ala gị nʼiyi. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
EZE 25:8 “Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na Moab na Sia sịrị, “Lee, Juda adịrịla ka mba ndị ọzọ niile,”
EZE 25:9 nʼihi nke a, aga m emeghe akụkụ Moab, site nʼobodo nke nsọtụ oke ala ya niile, bụ Bet-Jeshimọt, Baal-Meon na Kiriatem, nke bụ ebube nke ala ahụ.
EZE 25:10 Aga m ewere Moab na Amọn nyefee ha nʼaka ndị ga-esi nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ọ bụrụ nke ha. Nʼụzọ dị otu a, a gaghị agụkwa maọbụ cheta Amọn nʼetiti mba niile.
EZE 25:11 Aga m ata Moab ahụhụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
EZE 25:12 “Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na Edọm bọọrọ onwe ha ọbọ megide ụlọ Juda sitekwa nʼịbọ ọbọ ha bụrụ ndị ikpe mara,
EZE 25:13 nʼihi nke a, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esetipụ aka m megide Edọm, gbuo ndị bi nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ. Aga m eme ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ndị niile bi nʼala ahụ site na Teman ruo na Dedan ka a ga-eji mma agha gbuo.
EZE 25:14 Ọ bụ site nʼaka ndị nke m Izrel ka m ga-esi bọọ ọbọ megide Edọm, ha ga-emeso ndị Edọm dịka ịba ụba nke iwe m na ọnụma m si dị, ha ga-amata ihe ịbọ ọbọ bụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
EZE 25:15 “Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: ‘Nʼihi na ndị Filistia esitela na mmụọ nke ịbọ ọbọ, na mmụọ ịkpọ asị nke dị ha nʼobi bọọrọ onwe ha ọbọ, chọọ ịla ha nʼiyi.
EZE 25:16 Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ana m aga isetipụ aka m megide ndị Filistia. Aga m ebipụ ndị Keret, bibie ndị ahụ niile bi nʼọnụ mmiri osimiri.
EZE 25:17 Aga m esite nʼoke ọnụma bọọ ha ọbọ site na ịta ha ahụhụ. Mgbe ahụ ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m ga-abọgwata ha ọbọ.’ ”
EZE 26:1 Nʼụbọchị nke mbụ nʼọnwa, nʼafọ nke iri na otu, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị sị,
EZE 26:2 “Nwa nke mmadụ, Taịa aṅụrịala ọṅụ nʼihi ọdịda Jerusalem. Ọ na-ekwukwa na-asị, ‘Ahaa, agbajiela obodo ahụ bụ ọnụ ụzọ e si eje mba dị iche iche. Ọnụ ụzọ ama ya niile egherekwala oghe nye m. Ugbu a, e mebirila ya, ihe ga-agara m nke ọma karịa.’
EZE 26:3 Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Lee, ana m eguzo imegide gị Taịa. Aga m emekwa ka ọtụtụ mba bilie bịakwasị gị dịka ebili mmiri nke oke osimiri.
EZE 26:4 Ha ga-etida mgbidi Taịa niile, kwadakwa ụlọ elu ya niile. Aga m akọchapụ aja mgbidi ya dakpọrọ adakpọ mee ka ala ahụ ghọọ ala nkume nkume.
EZE 26:5 Ọ ga-aghọkwa ebe ndị ọkụ azụ na-agbasa ụgbụ ha nʼetiti oke osimiri. Nʼihi na mụ onwe m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Ọ ga-aghọkwara mba niile dị iche iche ihe a kwatara nʼagha.
EZE 26:6 Ma a ga-eji mma agha laa ụmụada ya bi nʼelu ala nʼiyi. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
EZE 26:7 “Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esite na mgbago ugwu kpọta Nebukadneza eze Babilọn, onye bụ eze ndị eze, ọ ga-achị ọtụtụ ndị agha na ụgbọala, na ndị na-agba ịnyịnya bilie imegide Taịa.
EZE 26:8 Ọ ga-ebu ụzọ jiri mma agha bibie ndị gị bi nʼelu ala. Ọ ga-agbakwa obodo gị gburugburu, wulie mgbidi agha ya elu, imegide mgbidi obodo gị. Ọ ga-ewelikwa ọta agha ya elu.
EZE 26:9 Ọ ga-echezikwa ihe agha e ji akwatu mgbidi nʼebe mgbidi gị dị, jiri ngwa agha ya kwada ụlọ elu gị niile.
EZE 26:10 Ịnyịnya ya ga-adị ọtụtụ nke ga-eme ka ha jiri uzuzu kpuchie gị. Mgbidi gị ga-ama jijiji nʼihi oke ụzụ nke ịnyịnya agha ndị a, na ụgbọ agha, na wagọn ịnyịnya na-adọkpụ ga-eme, mgbe ha na-abata nʼọnụ ụzọ ama gị, dị ka mgbe ọtụtụ mmadụ na-abanye nʼime obodo e tidara mgbidi ya.
EZE 26:11 Ọ ga-eji ụkwụ ịnyịnya ya niile zọtọọ okporoụzọ gị niile, jirikwa mma agha gbuchapụ ndị gị niile. Ogidi niile nke ike gị ga-adaru ala.
EZE 26:12 Ha ga-akwara akụ gị niile, na ihe ahịa gị niile dịka ihe ha dọtara nʼagha. Ha ga-akwatu mgbidi gị niile, na ụlọ ọma gị niile, kpokọtaa osisi gị niile, na nkume niile, na ngwongwo niile nʼabaghị uru wụnye ha nʼime osimiri.
EZE 26:13 Aga m emekwa ka ụzụ nke abụ gị niile kwụsị. A gaghị anụkwa ụda ụbọ akwara gị ọzọ.
EZE 26:14 Aga m emekwa ka ala gị ghọọ ala nkume nkume, nke ihe na-adịghị nʼime ya. Ị ga-abụkwa ebe ndị ọkụ azụ ga na-agbasa ụgbụ ha. Ọ dịghị onye ga-ewuzi gị ọzọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 26:15 “Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Taịa, Ọ bụ na agaghị anụ mkpọtụ ọdịda gị na mba ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri, mgbe ndị e merụrụ ahụ ga na-asụ ude nʼoge a na-egbu ndị bi nʼime gị?
EZE 26:16 Mgbe ahụ, ndị ndu nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri ga-esi nʼocheeze ha rịdata. Ha ga-eyipụ uwe mwụda ha, yipụsịakwa uwe ha niile a kpara nke ọma. Ha ga-anọdụ ọdụ nʼala na-ama jijiji site nʼoke egwu nʼihi ihe ha hụrụ dakwasịrị gị.
EZE 26:17 Ha ga-ebulikwa abụ akwa banyere gị, sị gị, “ ‘Lee ka i si laa nʼiyi, gị obodo a maara aha ya, nke ndị na-ejegharị nʼosimiri bi nʼime ya. Na mbụ, ị bụ obodo nke ịdị ike ya pụtara ihe nʼosimiri niile, gị na ndị bi nʼime gị. Ị na-emenyekwa ndị bi nʼime ya egwu.
EZE 26:18 Ugbu a, lee na ala niile dị nʼọnụ mmiri nke osimiri na-ama jijiji nʼihi ọdịda gị. Ọ bụladị agwa etiti niile ka ụjọ juru obi nʼihi nkwatu a kwatụrụ gị.’
EZE 26:19 “Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe m mere ka ị ghọọ obodo tọgbọrọ nʼefu, dịka obodo niile nke mmadụ na-ebighị, mgbe m mekwara ka ogbu mmiri nke oke osimiri bịakwasị gị, mgbe ọtụtụ mmiri ya kpuchiri gị,
EZE 26:20 mgbe ahụ ka m ga-eme ka ị rịdaruo nʼala mmụọ, gị na ndị na-arịda nʼolulu, ka i jekwuru ndị mgbe ochie. Aga m eme ka ebe obibi gị bụrụ nʼokpuru ime ime ala, ka ị dịrị ka obodo ndị ochie ahụ e tikpọrọ etikpọ. Gị na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ị gaghị esitekwa nʼebe ahụ lọghachi ịbịa isoro ndị dị ndụ birikwa.
EZE 26:21 Aga m eme ka ọgwụgwụ gị bụrụ ihe a ga-atụ egwu. Ị gaghị adịkwa. A ga-achọ gị, ma agaghị achọta gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
EZE 27:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 27:2 “Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere Taịa,
EZE 27:3 sị ya, gị oke obodo dị nʼọnụ oke osimiri, onye bụ onye ahịa nke mba niile dị nʼọnụ osimiri. ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Gị onwe gị, bụ Taịa, na-asị, “Ezuru m oke nʼịma mma.”
EZE 27:4 I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri. Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke.
EZE 27:5 Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị sitere nʼosisi junipa nke si Senia; ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike.
EZE 27:6 Osisi ook nke si Bashan ka e ji mee ụmara gị niile. Osisi e si Saiprọs bubata ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma.
EZE 27:7 Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata, ka e ji mee ọkọlọtọ gị. Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo, nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata.
EZE 27:8 Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị. Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri.
EZE 27:9 Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị. Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ. Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị.
EZE 27:10 “ ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya, na Put, jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị. Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị, na-ewetara gị ebube.
EZE 27:11 Ndị ikom Avad, na Helek bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile. Ndị ikom Gamad na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike. Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị, ime ka ịma mma gị zuo oke.
EZE 27:12 “ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
EZE 27:13 “ ‘Ndị Griis, Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
EZE 27:14 “ ‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere ihe ha zụrụ.
EZE 27:15 “ ‘Ndị ahịa si na Dedan bụkwa ndị ahịa gị. Otu a kwa ọtụtụ ndị bi nʼọnụ mmiri bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ọdụ, na osisi eboni kwụọ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
EZE 27:16 “ ‘Ndị Aram ka gị na ha zụrụ ahịa nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa gị. Ha na-ejikwa nkume dị oke ọnụ tọkwọisi na akwa e sijiri esiji odo odo, na akwa a kpara nke ọma, na ezi akwa ọcha, na koral, na nkume oke ọnụahịa rubi na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
EZE 27:17 “ ‘Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
EZE 27:18 “ ‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta,
EZE 27:19 na mmanya a gbara nʼudu nʼudu nke si Ụzal, na igwe nwupụrụ enwupụ, na kashia, na kalamus, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
EZE 27:20 “ ‘Dedan bụ onye ahịa gị nʼakwa a na-agbasa nʼelu ịnyịnya anọkwasị ọdụ.
EZE 27:21 “ ‘Arebịa na ụmụ eze niile nke Keda bụkwa ndị ahịa gị. Ọ bụ ụmụ atụrụ, na ebule, na mkpi, ka gị na ha nʼazụrịta na-erekwa.
EZE 27:22 “ ‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ.
EZE 27:23 “ ‘Ndị Haran, Kanne na Eden, na ndị ahịa Sheba, Ashọ na Kilmad, bụ ndị gị na ha zụkọrọ ahịa.
EZE 27:24 Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị.
EZE 27:25 “ ‘Ụgbọ mmiri niile nke Tashish bụ ndị na-ebu ihe ahịa gị. I jupụtara nʼihe ahịa, gị obodo dị nʼetiti mmiri.
EZE 27:26 Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị na-ebuba gị nʼosimiri. Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri.
EZE 27:27 Akụ gị niile, na ngwa ahịa gị niile, na ihe ịzụ ahịa gị niile, na ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ mmiri gị, na ndị na-anya ụgbọ mmiri, ma ndị na-edozi ụgbọ mmiri gị, ma ndị na-azụ ahịa gị, ma ndị agha gị niile, ha na ndị niile nọ nʼime ụgbọ gị ka mmiri ga-eri nʼetiti mmiri, nʼụbọchị ahụ ụgbọ gị ga-emikpu.
EZE 27:28 Ala niile dị nʼọnụ mmiri ga-ama jijiji mgbe ndị ọka ụgbọ mmiri gị ga-eti mkpu akwa.
EZE 27:29 Ndị niile na-anya ụgbọ mmiri, na ndị ọka ụgbọ niile nke oke osimiri, ga-esitekwa nʼụgbọ ha rịdata guzo nʼelu ala.
EZE 27:30 Ha ga-eti mkpu akwa, ha ga-akwa akwa nke ukwuu, werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi, na-atụrụkwa onwe ha na ntụ.
EZE 27:31 Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha, yirikwa akwa mkpe, kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha. Ha ga-etikwa aka ha nʼobi.
EZE 27:32 Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị, nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị, “Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa, nke osimiri gbara gburugburu?”
EZE 27:33 Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị, e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ. E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya.
EZE 27:34 Ugbu a, mmiri e riela gị, ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ. Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile, na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi.
EZE 27:35 Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiri osimiri niile anya. Ndị eze ha niile tụkwara egwu nke ukwuu; ihu ha gbarụkwara agbarụ site nʼegwu.
EZE 27:36 Ndị ahịa nke mba dị iche iche na-efufe isi ha, nʼihi na ihe mere gị dị egwu. Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ”
EZE 28:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 28:2 “Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “ ‘Nʼihi nganga nke juru gị obi, ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi, mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi, nke dị nʼetiti oke osimiri niile.” Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi.
EZE 28:3 Ị maara ihe karịa Daniel? Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ?
EZE 28:4 I werela amamihe gị na nghọta gị nwetara onwe gị akụ, tụkọba ọlaedo na ọlaọcha, nʼime ụlọakụ gị dị iche iche.
EZE 28:5 E, mmụta nʼịzụ ahịa gị emeela ka ị ghọọ ọgaranya, nʼihi akụnụba inwere ị bụrụla onye na-akpa nganga.
EZE 28:6 “ ‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu; “ ‘ebe ọ bụ na ị gụrụ onwe gị dịka onye maara ihe onye maara ihe dịka chi,
EZE 28:7 ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị, bụ mba kachasị mba niile dị iche iche njọ na-enweghị obi ebere. Ha ga-amịpụta mma agha ha megide ịma mma gị na amamihe gị, ha ga-adụwakwa ebube nke mma gị.
EZE 28:8 Ha ga-eme ka ị rịdaruo nʼolulu nke ala mmụọ. Ị ga-anwụ ọnwụ ike nʼetiti oke osimiri niile.
EZE 28:9 Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,” nʼihu ndị ahụ na-egbu gị? Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, nʼaka ndị ahụ na-egbu gị.
EZE 28:10 Ị ga-anwụ ọnwụ dịka ndị a na-ebighị ugwu, site nʼaka ndị ọbịa. Mụ onwe m ekwuola, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
EZE 28:11 Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,
EZE 28:12 “Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Gị onwe gị bụ akara izuoke, ị jupụtara na amamihe na ịma mma.
EZE 28:13 Ị nọ nʼIden, nʼubi Chineke a gbara ogige. Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma, rubi, na topaazi, na emeralụdụ, na krisolaịt, na ọniks, na jaspa, na safaia, na tọkwọisi, na beril. A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo. Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha.
EZE 28:14 Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub, ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ. Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ, na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ.
EZE 28:15 Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị, tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị.
EZE 28:16 Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị ị ghọrọ onye na-eme ihe ike, si otu a mehiekwa. Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị. Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị, gị cherub na-ekpuchi ekpuchi.
EZE 28:17 Obi gị jupụtara na nganga nʼihi ịma mma gị, i mere ka amamihe gị bụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị. Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala, mee ka ị bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile.
EZE 28:18 Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị, i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ. Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta, repịa gị. Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala, nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya.
EZE 28:19 Ndị niile maara gị ka ihe ndị a juru anya, nʼihi na ị ghọọla ihe oke egwu. Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ”
EZE 28:20 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 28:21 “Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya,
EZE 28:22 ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn, nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m. Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị mgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu, nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ.
EZE 28:23 Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya, meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile. Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya, site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 28:24 “ ‘Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
EZE 28:25 “ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị Izrel ga-alọghachi biri nʼala nke aka ha ọzọ, ala nke m nyere nna ha Jekọb ohu m. Nʼihi na aga m esite na mba niile ha gbasasịrị chịkọtaa ha, si otu a gosi mba niile nke ụwa ịdị nsọ m.
EZE 28:26 Ha ga-ebi nʼala a na ntụkwasị obi. Ha ga-ewu ụlọ, kụọ ubi vaịnị, birikwa na-atụghị egwu ọbụla. Mgbe m pịachara mba niile dị ha gburugburu ụtarị, bụ mba ndị ahụ mekpara ha ahụ, mgbe ahụ, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.’ ”
EZE 29:1 Nʼafọ nke iri, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri na abụọ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 29:2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile.
EZE 29:3 Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “ ‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt, gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi. Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl, ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.”
EZE 29:4 Ma aga m etinye nko nʼagba gị, mee ka azụ niile nke iyi gị niile rapara nʼakpịrịkpa gị. Aga m adọpụta gị site nʼetiti iyi gị niile, mee ka azụ niile rapara nʼakpịrịkpa gị.
EZE 29:5 Aga m ahapụ gị na azụ niile nke osimiri iyi gị nʼọzara, ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ nʼala ubi, a gaghị eli unu eli maọbụ tụtụọ unu, nʼihi na emeela m ka unu bụrụ nri nye anụ ọhịa niile, na nnụnụ niile.
EZE 29:6 Mgbe ahụ, ndị niile bi nʼIjipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. “ ‘Ị dịrịla ka mkpanaka achara nʼebe ụlọ Izrel nọ.
EZE 29:7 Mgbe ha jidere gị nʼaka, ị nyajiri dọwaa ha ubu ha. Mgbe ha dabeere na gị, ị gbajiri mee ka ha ghara inwekwa ike iguzosi ike nʼụkwụ ha.
EZE 29:8 “ ‘Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, aga m eme ka mma agha bịakwasị gị, aga m ebipụkwa mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime gị.
EZE 29:9 Ala Ijipt ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu; ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. “ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Osimiri Naịl bụ nke m. Ọ bụ m kere ya.”
EZE 29:10 Nʼihi ya, aga m edo onwe m megide gị, megidekwa osimiri gị. Aga m ala Ijipt niile nʼiyi site na Migdol ruo Aswan, ruokwa nʼoke ala ha na ndị Kush.
EZE 29:11 Ọ dịghị ụkwụ anụmanụ maọbụ mmadụ ga-agafe nʼime ya, agaghị ebikwa nʼime ya ruo mgbe iri afọ anọ gasịrị.
EZE 29:12 Aga m emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mkpọmkpọ ala niile, obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu iri afọ anọ nʼetiti obodo ndị e mere ka ha laa nʼiyi. Aga m achụsasị ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile.
EZE 29:13 “ ‘Ọzọkwa, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼọgwụgwụ iri afọ anọ ahụ, aga m achịkọtakwa ndị Ijipt site nʼebe niile ha gbasara.
EZE 29:14 Aga m emekwa ka ndị ya niile laghachi nʼala Patros, ala ebe a mụrụ ha. Ma Ijipt agaghị abụkwa alaeze a maara nke ọma ọzọ.
EZE 29:15 Ọ ga-abụ alaeze dị nnọọ ala karịa alaeze niile. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ọ ga-eweli onwe ya elu karịa mba ọzọ niile. Aga m emekwa ka ha dị nta, nke ha agaghị inwe ike achịkwa mba niile ọzọ.
EZE 29:16 Ijipt agaghị abụkwara ụlọ Izrel ihe ntụkwasị obi, kama ọ ga-abụrụ ha ihe iji cheta mmehie ha mere mgbe ha lere anya enyemaka site nʼaka ya. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụOnyenwe anyị.’ ”
EZE 29:17 Ọ ruo, nʼiri afọ abụọ na asaa, nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke mbụ, ka okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 29:18 “Nwa nke mmadụ, Nebukadneza bụ eze Babilọn mere ka ndị agha ya lụsoo Taịa ọgụ nʼebe ọ dị ukwuu. Isi niile ọbụla ka e mere ka ọ kwọchasịa, ubu niile kwa echihịara echihịa. Ma ya na ndị agha ya anataghị ụgwọ ọrụ ọbụla, nʼagha ahụ o buru megide Taịa.
EZE 29:19 Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu sị: Lee, ana m aga inye Nebukadneza eze Babilọn ala Ijipt. Ọ ga-akwakọrọ akụnụba ya, ọ ga-azacha ma bukọrọkwa ihe niile nke dị nʼala ahụ. Ha ga-abụkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya.
EZE 29:20 Enyefeela m ala Ijipt nʼaka ya, ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ ya, nʼihi na ya na ndị agha ya rụụrụ m ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
EZE 29:21 “Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka otu mpi puputara ụlọ Izrel. Aga m asaghekwa ọnụ gị nʼetiti ha. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
EZE 30:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 30:2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “ ‘Kwasienụ akwa ike ma sị, “Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!”
EZE 30:3 Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso, Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso, ụbọchị igwe ojii, ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi.
EZE 30:4 Mma agha ga-abịakwasị Ijipt, ihe mgbu ga-adakwasị Kush. Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala, a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya, mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi.
EZE 30:5 Kush na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha.
EZE 30:6 “ ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada, nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa. Site na Migdol ruo nʼAswan, ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 30:7 Ha ga-atọgbọrọ nʼefu, nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu. Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe, nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi.
EZE 30:8 Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt, mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka.
EZE 30:9 “ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu.
EZE 30:10 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọn bibie igwe ndị agha Ijipt niile.
EZE 30:11 Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere, ka a ga-akpọbata ka ha bịa bibie ala ahụ. Ha ga-amịpụta mma agha ha megide Ijipt, werekwa ozu ndị e gburu egbu tụsasịa nʼala ahụ.
EZE 30:12 Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ. Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ. Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi. Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
EZE 30:13 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi, mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị. Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt, aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile.
EZE 30:14 Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu. Aga m etinye ọkụ na Zoan, ma taa Tibs ahụhụ.
EZE 30:15 M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m, bụ ebe siri ike nke Ijipt, m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile.
EZE 30:16 Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt, Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu. A ga-eji ike tipịa Tibs. Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile.
EZE 30:17 Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti ga-anwụ site na mma agha. Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha.
EZE 30:18 Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis mgbe m ga-agbaji yoku Ijipt, nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị. Igwe ojii ga-ekpuchi ya, a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha.
EZE 30:19 Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu, ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
EZE 30:20 O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 30:21 “Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha.
EZE 30:22 Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ.
EZE 30:23 Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile,
EZE 30:24 meekwa ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike. Aga m etinye mma agha m nʼaka ya, ma ogwe aka abụọ nke Fero ka m ga-agbajisi. Mgbe ahụ, Fero ga-asụ ude nʼihu eze Babilọn dịka onye e merụrụ ahụ.
EZE 30:25 Aga m eme ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike; ma ogwe aka Fero ga-akpọnwụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyere mma agha nʼaka eze Babilọn, na mgbe o setịpụrụ ya imegide Ijipt.
EZE 30:26 Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
EZE 31:1 O ruo, nʼafọ nke iri na otu, nʼọnwa nke atọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 31:2 “Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha, “ ‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu?
EZE 31:3 Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa, nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya. Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn, nke jupụtara nʼalaka mara mma, nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo, nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile.
EZE 31:4 O nwetara mmiri mere ka o buo ibu, na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo. Iyi ha niile na-asọ nʼokpuru ya. Ebe ahụ ka ha si ezipu ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri.
EZE 31:5 Nʼihi ya, o toro tokarịa osisi niile nʼogologo. Ngalaba ya bara ụba, alaka ya topụkwara ogologo nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta.
EZE 31:6 Nʼalaka ya niile ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ, nʼokpuru ndo nke alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ, oke mba niile dị iche iche bikwara nʼokpuru ndo ya.
EZE 31:7 Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya, nʼogologo nke alaka ya nʼawasa, nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba nʼebe mmiri dị ukwuu.
EZE 31:8 Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige erughị ya nʼọtụtụ. Ọ dịghị osisi junipa niile nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya, osisi plenụ niile adịghịkwa ka alaka ya, ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige, nke yiri ya nʼịma mma ya
EZE 31:9 Emere m ya ka ọ maa mma site nʼịba ụba nke alaka o nwere, ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIden nʼubi Chineke a gbara ogige.
EZE 31:10 “ ‘Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na o toro ogologo tokarịa osisi ọhịa niile, nʼihi na ọ nyara isi banyere ọnọdụ ịdị ogologo ya karịa ndị ọzọ,
EZE 31:11 Eweere m ya nyefee nʼaka onye ahụ na-achị mba niile, ka o mesie ya ike, dịka ịba ụba nke ajọ omume ya si dị. Ewezugakwara m ya nʼakụkụ.
EZE 31:12 Mba ahụ kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere gbuturu ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼala. Ngalaba ya dara nʼelu ugwu ukwu niile nakwa nʼime ndagwurugwu niile. Alaka ya kwa dajisịrị danyesịa nʼime ebe niile gbawara agbawa nke ala mmiri si eru. Mba niile nke ụwa sitere nʼokpuru ndo ya pụta wezuga onwe ha.
EZE 31:13 Ụmụ nnụnụ niile bere nʼelu ukwu osisi ahụ dara ada, nʼetiti alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa bịara biri.
EZE 31:14 Ya mere, ka osisi niile nke dị nʼakụkụ mmiri gharakwa eto ogologo, maọbụ ka ọnụ ọnụ ya ghakwara ịdị elu karịa alaka ndị ahụ bara ụba. Nyekwa na ọ dịkwaghị osisi ọbụla na-enwetazu mmiri nke ga-etoru osisi ndị ahụ nʼogologo. Nʼihi na edebela ha nye ọnwụ, nye ịrịdaru nʼokpuru ụwa, nʼetiti ndị mmadụ ndị na-arịda nʼolulu omimi ahụ.
EZE 31:15 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ e mere ka ọ rịdaruo nʼala mmụọ, a kwụsịrị m ogbu mmiri niile were ha kpuchie ya. A kwụsịrị nsọgharị nke mmiri, meekwa ka ịba ụba nke mmiri ya niile kwụsị. Nʼihi ya, eyinyere m Lebanọn uwe mkpe, osisi niile nke ọhịa kpọnwụkwara nʼihi ya.
EZE 31:16 Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma.
EZE 31:17 Ha onwe ha kwa, dịka sida ukwuu ahụ, sokwaara gbadaruo nʼala mmụọ, gakwuru ndị niile eji mma agha gbuo, ha na ndị ikom ji mma agha bụ ndị biri nʼokpuru ndo ya nʼetiti mba dị iche iche.
EZE 31:18 “ ‘Olee osisi dị nʼIden a ga-eji tụnyere gị nʼịma mma, na nʼịdị ebube? Ma gị onwe gị kwa, na osisi ndị a niile dị nʼIden ka a ga-eme ka unu rịdaruo nʼokpuru ụwa. Ị ga-edina nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị eji mma agha gbuo. “ ‘Nke a bụ Fero na usuu ndị agha ya niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
EZE 32:1 Nʼafọ nke iri na abụọ, nʼọnwa nke iri na abụọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,
EZE 32:2 “Nwa nke mmadụ, buliere Fero bụ eze Ijipt, abụ akwa sị ya, “ ‘Ị dị ka ọdụm nʼetiti mba niile. Ị dịkwa ka ogologo anụ ọjọọ na-anọ nʼosimiri. I na-akpụgharị onwe gị nʼime mmiri. I ji ụkwụ abụọ na-agbarụ mmiri, na-emekwa ka mmiri iyi niile gbarụọ.
EZE 32:3 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Aga m eji ọtụtụ ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ gbasaa ụgbụ m nʼelu gị. Ha ga-adọkpụkwara gị nʼime ụgbụ m.
EZE 32:4 Aga m atụsa gị nʼala, nʼọhịa ka m ga-atụfukwa gị, meekwa ka ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe bekwasị gị. Aga m emekwa ka anụ ọhịa nke ụwa niile rijuo afọ nʼanụ ahụ gị.
EZE 32:5 Aga m tụsasịkwa anụ ahụ gị nʼugwu niile, werekwa ihe ọbụla fọdụrụ nʼime gị mejuo ndagwurugwu niile.
EZE 32:6 M ga-eji ọbara gị na-asọ asọ dee ala niile dịka mmiri ọ bụladị ruo nʼugwu niile, ebe niile mmiri si erufe ga-ejupụtakwa nʼanụ ahụ gị.
EZE 32:7 Mgbe m ga-emenyụ gị dịka ọkụ, aga m ekpuchi ihu eluigwe, meekwa ka kpakpando niile jie nji. Aga m eji igwe ojii mechie ihu anyanwụ, ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.
EZE 32:8 Ihe niile nke na-enye ìhè nʼeluigwe ka m ga-eme ka ha jie nji nʼelu gị, mee ka ọchịchịrị gbachie nʼala gị niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
EZE 32:9 Aga m eweta obi mgbawa nʼetiti ndị mmadụ dị iche iche mgbe m ga-eme ka mbibi gị bịa nʼetiti mba niile nʼime ala dị iche iche nke ị na-amaghị.
EZE 32:10 Aga m eme ka i ju ọtụtụ ndị mmadụ anya, ndị eze ha ga-ama jijiji nʼụjọ maka gị mgbe m ga-efegharị mma agha m nʼihu ha. Onye ọbụla nʼime ha ga-ama jijiji na ntabi anya ọbụla nʼihi ndụ ya nʼụbọchị ahụ, ị ga-ada.
EZE 32:11 “ ‘Nʼihi na nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Mma agha nke eze Babilọn ga-abịakwasị gị.
EZE 32:12 Usuu ndị agha gị ga-adakwa nʼihu mma agha nke ndị dị ike, bụ ndị mba ahụ kachasị mba niile njọ. Nganga niile nke Ijipt na ndị ya, ka ha ga-egwepịa. Ha ga-akwatu usuu ndị agha ha niile.
EZE 32:13 Aga m emekwa ka anụmanụ ya niile, nke na-ata ahịhịa nʼakụkụ mmiri laa nʼiyi. Ụkwụ mmadụ, na ụkwụ anụmanụ agakwaghị agbarụ mmiri ahụ ọzọ.
EZE 32:14 Nʼihi ya, mmiri niile nke ya ga-adị ọcha, na-asọkwa dịka mmanụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru.
EZE 32:15 Mgbe m bibiri Ijipt, kpochapụkwa ihe niile dị nʼime ya, mgbe m tidara ndị niile bi nʼime ya, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
EZE 32:16 “Nke a bụ abụ akwa ha ga-abụrụ ya. Ndị inyom mba dị iche iche ga-abụ ya. Ha ga-abụ ya nʼihi Ijipt na usuu ndị agha ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
EZE 32:17 Nʼafọ nke iri na abụọ ahụ, nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị sị,
EZE 32:18 “Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa nʼihi usuu ndị agha Ijipt niile, wezuga ha baa nʼokpuru ụwa ma ndị inyom mba dị iche iche dị ukwuu, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu.
EZE 32:19 Gwa ha okwu sị ha, ‘Unu o nwere ihuọma karịa ndị ọzọ? Lee, ihe na-eche gị bụ olulu. Ọ bụkwa ndị a na-ebighị ugwu ka ị ga-edinakwuru.’
EZE 32:20 Nʼetiti ndị e ji mma agha gbuo ka ha ga-ada. Amịpụtala mma agha maka ya, ka a dọkpụrụ ya na igwe ndị ya niile pụọ.
EZE 32:21 Ndị dike nke ndị ndu dike ga-esite nʼala mmụọ kwuo banyere Ijipt na ndị niile ha na ya dị na mma, ‘Ha arịdatala, ha na-edina ala ha na ndị a na-ebighị ugwu, nakwa ndị niile ahụ e ji mma agha gbuo.’
EZE 32:22 “Nʼebe ahụ ka Asịrịa na ndị agha ya niile nọ; ili ndị niile o gburu egbu gbara ya gburugburu, bụ ndị niile nwụrụ site na mma agha.
EZE 32:23 Ili ha dị na nsọtụ niile nke olulu, ndị agha ya niile gbakwara ili ya gburugburu. E gbudala ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ. Ndị a nwụrụ site na mma agha.
EZE 32:24 “Nʼebe ahụ ka Elam na usuu ndị agha ya nọ gbaa ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị e gburu egbu, ndị nwụrụ site na mma agha. Ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ arịdaruola nʼolulu ahụ dịka ndị a na-ebighị ugwu. Ha esorola ndị ahụ rịdaruru nʼala mmụọ keta oke nʼihere dịrị ha.
EZE 32:25 E meere ya ebe ndina nʼetiti ndị nwụrụ anwụ. Igwe mmadụ ya nwụrụ anwụ gbakwara ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị a na-ebighị ugwu, ndị e ji mma agha gbuo, nʼihi na-emere ka oke egwu ha dị nʼala ndị dị ndụ, ma ha na-eburu ihere ha, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ha bụ ndị e debere nʼetiti ndị nwụrụ anwụ.
EZE 32:26 “Meshek na Tubal nọkwa nʼebe ahụ, ha na usuu ndị agha ha niile, gburugburu ili ha. Ha niile bụkwa ndị a na-ebighị ugwu, ndị e ji mma agha gbuo, nʼihi na ha mere ka oke egwu ha dị nʼala ndị dị ndụ.
EZE 32:27 Ugbu a, e likọọla ha na ndị a na-ebighị ugwu, bụ ndị dike nʼagha, ndị nwụrụ anwụ, ndị ji ngwa agha ha gbadaa nʼime ili ha, ndị e hinyere ngwa agha ha nʼokpuru isi ha, ebe ọta ha dịkwasịrị nʼọkpụkpụ mgbe e tinyere ha nʼili. Ma nʼezie, ndị a bụ dike nʼagha mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ.
EZE 32:28 “Ma gị onwe gị, bụ Fero, otu a ka a ga-esi gbajie gị, ị ga-edinakwa nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị e ji mma agha gbuo.
EZE 32:29 “Nʼebe ahụ ka Edọm na ndị eze ya, na ndịisi ya niile nọ. Nʼagbanyeghị ịdị ike ha, ha na ndị e ji mma agha gbuo tọgbọrọ nʼebe ahụ. Ha na ndị a na-ebighị ugwu so dinaa, bụ ndị na-arịdaru nʼolulu.
EZE 32:30 “Ndịisi nke mba ndị ugwu, na ndị Saịdọn niile nọ nʼebe ahụ. Ụjọ niile nke ha sitere nʼisiike ha menye ndị mmadụ egbochighị ha iketa oke nʼihere nke iso ndị e gburu egbu nwụọ. Ha soro ndị eji mma agha gbuo dinaa na-ebighị ugwu, buru ihere ha, ha na-arịdaru nʼolulu.
EZE 32:31 “Fero na ndị agha ya niile ga-ahụ ndị a, ọ ga-enwe nkasiobi maka ndị ya niile, na usuu ndị agha ya niile ndị eji mma agha gbuo. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
EZE 32:32 Nʼagbanyeghị na emeela m ka ọ gbasaa ụjọ nʼala ndị dị ndụ, Fero na igwe mmadụ a niile ka a ga-eli nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, ya na ndị ejiri mma agha gbuo. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
EZE 33:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 33:2 “Nwa nke mmadụ, gwa ndị gị okwu sị ha, ‘Mgbe m wetara mma agha imegide mba ọbụla, ma ndị ala ahụ ahọpụta otu onye nʼetiti ha mee ya ka ọ ghọrọ ha onye nche,
EZE 33:3 onye ga-ahụ mma agha ka ọ na-abịakwasị ala ahụ, ọ bụrụ na o gbuo opi ike, ịdọ ndị bi na mba ahụ aka na ntị banyere mma agha nke na-abịa,
EZE 33:4 ọ bụrụkwa na onye ọbụla anụ opi ike ahụ ma jụ ịnabatara onwe ya ịdọ aka na ntị ahụ, mma agha ahụ gbuo ya, ọbara ya ga-adịkwasị ya nʼisi.
EZE 33:5 Nʼihi na ha nụrụ ụda opi nke ịdọ aka na ntị ahụ ma ha geghị ntị. Ọ bụ ha wetaara onwe ha ịla nʼiyi. A sị na ha gere ntị ha gaara azọpụta ndụ ha.
EZE 33:6 Ma ọ bụrụ na onye nche elepụ anya hụ ndị agha ka ha na-abịa hapụ igbu opi ịdọ ndị mmadụ aka na ntị, ọnwụ ha dị nʼisi ya. Ha ga-anwụ nʼime mmehie ha, ma aga m ajụta ọbara ha site nʼaka onye nche ahụ.’
EZE 33:7 “Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.
EZE 33:8 Mgbe m na-asị onye ajọ omume, gị onye na-emebi iwu, ị ghaghị ịnwụ! Ọ bụrụ na ị kwughị okwu, ime ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.
EZE 33:9 Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, ma o meghị nke a, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha, ma ndụ gị onwe gị ka ị zọpụtara.
EZE 33:10 “Nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka unu na-ekwu, “Njehie niile anyị na mmehie niile anyị adịla arọ nʼahụ anyị. Ọ bụkwa nʼime ya ka anyị na-ata ahụ. Olee otu anyị ga-esi dị ndụ?” ’
EZE 33:11 Gwa ha, ‘Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ọnwụ onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ, kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu sitere nʼụzọ ya chegharịa dịrị ndụ. Chigharịanụ, sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu niile chigharịa. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji nwụọ, unu bụ ụlọ Izrel?’
EZE 33:12 “Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, gwa ndị ala gị, ‘Ezi omume nke onye na-eme ezi ihe agaghị azọpụta ya ma ọ bụrụ na ọ tụgharịa, mee ihe ọjọọ. Otu a kwa, mmehie niile nke onye na-emebi iwu agaghị eme ka ọ laa nʼiyi ma ọ bụrụ na o chegharịa pụọ site na mmehie.’
EZE 33:13 Ọ bụrụ na m asị onye ezi omume, na ọ ghaghị ịdị ndụ, ma onye dị otu a atụkwasị obi nʼezi omume ya mee ajọ ihe, ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Ha ga-anwụ nʼihi ajọ ihe ha mere.
EZE 33:14 Ma ọ bụrụ na m asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma onye ahụ esite na mmehie ya chigharịa, mee ihe ziri ezi na nke dị mma,
EZE 33:15 ọ bụrụ na o nyeghachi ihe ebe ọ naara nʼaka ndị ọ gbazinyere ego, kwụghachi ihe niile o zuuru nʼohi, gbasoo ụkpụrụ ahụ niile bụ nke na-enye ndụ, gharakwa ime ajọ omume; onye dị otu a aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ.
EZE 33:16 Ọ dịghị mmehie niile nke onye ahụ mere nke a ga-echeta megide ya. Nʼihi na o meela ihe ziri ezi na nke dịkwa mma, ọ gaghị ịdị ndụ.
EZE 33:17 “Ma ndị gị na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma ọ bụ ụzọ ha bụ nke na-ezighị ezi.
EZE 33:18 Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime ihe ọjọọ, ọ ga-anwụ maka ya.
EZE 33:19 Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume ya chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-adị ndụ site nʼime nke a.
EZE 33:20 Ma unu bụ ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị.”
EZE 33:21 O ruo nʼafọ nke iri na abụọ nke e mere ka anyị jee biri na mba ọzọ, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, otu onye nʼime ndị sitere na Jerusalem gbapụ bịakwutere m gwa m sị, “Obodo ahụ adaala.”
EZE 33:22 Ma nʼanyasị, tupu onye ahụ gbapụrụ agbapụ abịa, aka Onyenwe anyị ruru m ahụ, mee ka m nweekwa ike ikwu okwu ọzọ.
EZE 33:23 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 33:24 “Nwa nke mmadụ, ndị ahụ bi nʼebe dakpọsịrị adakpọsị nʼala Izrel na-asị, ‘Ebraham bụ otu nwoke, ma o nwetachara ala a niile! Ma anyị dị ukwuu, nʼihi enyela anyị ala dịka ihe nweta anyị.’
EZE 33:25 Ya mere, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na unu na-eri anụ nke ọbara dị nʼime ya, na-elekwasịkwa arụsị unu anya, na-awụsikwa ọbara, o kwesiri ka unu nweta ala a?
EZE 33:26 Unu na-atụkwasị obi unu na mma agha unu, unu na-eme ihe arụ dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu na-emerụ nwunye onye agbataobi ya. Ọ bụkwa ala nke a ka unu ga-enweta?’
EZE 33:27 “Gwa ha nke a, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, dịka m na-adị ndụ, ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ e tikpọrọ etikpọ ga-anwụcha site na mma agha. Ndị bi nʼọhịa ka anụ ọhịa ga-atagbu. Ndị niile bi nʼọgba na nʼebe niile e wusiri ike ga-anwụ site nʼọrịa.
EZE 33:28 Aga m eme ka ala unu ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Nganga ya, na ike ya ga-agwụsị. Obodo niile dị nʼugwu Izrel ga-aghọ ebe e tikpọrọ etikpọ, mmadụ agakwaghị esite nʼebe ahụ gafee ọzọ.
EZE 33:29 Ha ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesiri ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi ihe arụ niile nke ha mere.’
EZE 33:30 “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, ndị ala gị na-ekwu banyere gị nʼakụkụ mgbidi ha na nʼọnụ ụzọ ụlọ ha. Ha na-asịrịta onwe ha, ‘Bịanụ ka anyị gaa nụrụ ozi sitere nʼọnụ Onyenwe anyị.’
EZE 33:31 Ha na-abịakwute gị dịka ndị mmadụ si abịa, ha na-anọrọ ala nʼihu gị na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya nʼomume: nʼihi na ha na-eji egbugbere ọnụ ha na-egosi ịhụnanya, ma obi ha nọ naanị na uru ọjọọ ha ga-enweta.
EZE 33:32 Nʼanya ha, ị dịka onye ji ezigbo olu na-ekwe ukwe ịhụnanya, dịka onye nwere olu ụtọ, nke na-abụ abụ dị ụtọ, na onye maara ka e si eti ịgba. Ha na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha ejighị ya kpọrọ ihe ọbụla.
EZE 33:33 “Ma mgbe nke a bịara na mmezu, nʼihi ọ ghaghị ịbịa, ha ga-amata na onye amụma anọtụla nʼetiti ha.”
EZE 34:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 34:2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị ọzụzụ atụrụ Izrel niile, buo amụma sị ha, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ahụhụ na-adịrị unu ndị ọzụzụ atụrụ Izrel, ndị na-enyeju naanị onwe ha afọ. Ọ kwesighị ka onye ọzụzụ atụrụ lekọtazie igwe atụrụ e tinyere nʼaka ya anya?
EZE 34:3 Unu na-eri abụba ha niile, unu na-eyi uwe ajị anụ, na-egbu anụ ndị mara abụba nʼagbanyeghị na unu adịghị elekọta igwe ewu na atụrụ m ndị a.
EZE 34:4 Unu anaghị eme ka ndị na-adịghị ike dị ike, maọbụ gwọọ ndị na-arịa ọrịa, maọbụ kechie ọnya ndị merụrụ ahụ. Unu adịghị akpọghachite ndị kpafuru akpafu, maọbụ pụọ ịchọ ndị furu efu. Kama naanị aka ike ka unu ji na-achị ha.
EZE 34:5 Nʼihi ya, ha agbasasịala nʼihi na onye ọzụzụ atụrụ anọghị ya. Ha aghọkwaarala anụ ọhịa niile ihe oriri.
EZE 34:6 Igwe ewu na atụrụ nke m na-awagharị nʼugwu niile, na nʼelu ugwu nta niile. Ọ bụkwa nʼelu ụwa niile ka ha gbasara. Ọ dịkwaghị onye na-ajụ ajụjụ banyere ha. Ọ dịkwaghị onye na-elenye anya nʼebe ha nọ.
EZE 34:7 “ ‘Nʼihi nke a, unu ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị:
EZE 34:8 Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ebe unu hapụrụ igwe atụrụ m na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ, mee ka ha ghọọrọ anụ ọhịa ihe oriri, ebe unu na-achọgharịghị ha, kama unu nọ na-enyeju onwe unu afọ, ma hapụ igwe atụrụ m ka agụụ gbuo ha,
EZE 34:9 nʼihi ya, unu ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị:
EZE 34:10 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ana m edo onwe m megide ndị ọzụzụ atụrụ niile. Ọ bụkwa nʼaka ha ka m ga-ajụta ihe banyere igwe ewu na atụrụ m. Aga m eme ka ha kwụsị ị bụ ndị na-azụ igwe ewu na atụrụ m, ka ndị ọzụzụ atụrụ ndị a ghara ịzụ onwe ha nri ọzọ. Aga m esite nʼọnụ ha napụta igwe ewu na atụrụ m, ha agaghị abụkwara ha nri ọzọ.
EZE 34:11 “ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, mụ onwe m ga-eji aka m pụọ gaa chọgharịa igwe atụrụ m. Mụ onwe m kwa ga-elekọta ha.
EZE 34:12 Dịka onye ọzụzụ atụrụ si elekọta igwe ewu na atụrụ ya anya, mgbe ha na ya nọ, otu a ka m ga-esi lekọta igwe atụrụ m. Aga m anapụta ha site nʼebe niile ha gbasasịrị gaa, nʼụbọchị igwe ojii na ọchịchịrị ahụ.
EZE 34:13 Aga m esite nʼobodo niile, na mba niile ha nọ kpọghachi ha nʼala nke ha. Aga m azụ ha nri nʼelu ugwu niile nke Izrel, na nʼakụkụ mmiri niile, ebe ala na-ewepụta nri nke ọma.
EZE 34:14 Aga m azụ ha nʼebe ịta ahịhịa mara mma, na nʼelu ugwu niile nke Izrel. Nʼebe ahụ ka ha ga-amakpukwa nʼudo. Ha ga-ata nri nʼebe ịta ahịhịa mara mma nke elu ugwu Izrel.
EZE 34:15 Ọ bụ mụ onwe m ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ nke atụrụ m niile. Aga m eme ka ha makpuru nʼudo, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
EZE 34:16 Aga m achọ ndị furu efu nʼime ha, ndị kpafuru akpafu, kpọghachite ha nʼụlọ. Aga m ekechi ọnya ndị merụrụ ahụ, meekwa ka ọ dị ike. Ma ndị mara abụba na nke ndị ahụ dị ike ka m ga-ala nʼiyi. Aga m eji ikpe ziri ezi zụọ ha.
EZE 34:17 “ ‘Ma unu onwe unu, ụmụ igwe anụ ụlọ m, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m ekpe ikpe nʼetiti atụrụ na atụrụ, ebule na mkpi.
EZE 34:18 Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-ata nri kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ zọtọsịa nke fọdụrụ? Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-aṅụ mmiri nke kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ unu na-agbarụ nke fọdụrụ?
EZE 34:19 Ọ bụ ihe kwesiri ekwesi na igwe atụrụ m ga-ata nri unu zọtọrọ azọtọ, ma ṅụọkwa mmiri unu gbarụrụ agbarụ?
EZE 34:20 “ ‘Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ha, nʼezie, mụ onwe m ga-ekpe ikpe nʼetiti atụrụ ndị gbara abụba, na atụrụ ndị a tara ahụ.
EZE 34:21 Nʼihi na unu ji akụkụ ahụ unu, na ubu aka unu na-enupu ha. Unu jikwa mpi unu na-enupu ndị na-adịghị ike, tutu ruo mgbe unu chụsachara ha.
EZE 34:22 Lee, aga m azọpụta igwe ewu na atụrụ m. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya. Ha agaghị aghọkwa ihe oriri ọzọ. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya.
EZE 34:23 Aga m edobe otu onye ọzụzụ atụrụ nke ga-elekọta ndị m, ọ bụladị ohu m Devid. Ya onwe ya ga-elekọta ha, bụrụkwa onye ọzụzụ atụrụ nye ha.
EZE 34:24 Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ga-abụ Chineke ha, ma ohu m Devid ga-abụ onyeisi nʼetiti ndị m. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
EZE 34:25 “ ‘Mụ na ha ga-agba ndụ udo. Aga m achụpụkwa anụ ọjọọ niile nʼala ha, ka ndị m nwee ike ibi nʼudo nʼọzara, ma rahụkwa ụra ọ bụladị nʼetiti oke ọhịa nʼenweghị nsogbu.
EZE 34:26 Aga m agọzi ndị m, gọziekwa ebe obibi ha na ihe niile gbara ugwu nta m gburugburu. Aga m ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, nʼezie, ngọzị ga-ezoro ha dịka mmiri.
EZE 34:27 Osisi ọhịa ga-amị mkpụrụ ya, ala ga-eme ihe omume ya. Ndị m ga-anọkwa nʼudo nʼala ha na-atụghị ụjọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tijasịrị mkpọrọ yoku niile ha, napụta ha site nʼaka ndị na-akpagbu ha.
EZE 34:28 Ha agaghị abụkwa mba ndị ọzọ na-apụnara ihe ha nwere, maọbụ ndị anụ ọhịa ga-adọgbu. Ha ga-ebi na-atụghị ụjọ, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.
EZE 34:29 Aga m enye ha ala nke amaara nke ọma nʼihi ihe na-epupụta nʼime ya, ha agaghị abụkwa ndị ụnwụ mekpara ahụ nʼala ahụ ọzọ, maọbụ ihe a na-akwa emo nke mba dị iche iche.
EZE 34:30 Ha ga-amata na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke ha, na m na-anọnyere ha, na ha onwe ha kwa, bụ ụlọ Izrel, bụ ndị m, otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwupụtara.
EZE 34:31 Unu bụ igwe ewu na atụrụ m, atụrụ nke ebe ịta nri m, mụ onwe m bụkwa Chineke unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
EZE 35:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 35:2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu imegide nʼugwu Sia, buo amụma megide ya,
EZE 35:3 sị ya, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Mụ onwe m na-emegide gị, gị ugwu Sia. Aga m esetikwa aka m imegide gị, mee gị ka ị ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu.
EZE 35:4 Obodo gị niile ka m ga-eme ka ha ghọọ mkpọmkpọ ebe, gị onwe gị ga-abụkwa ebe tọgbọrọ nʼefu. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 35:5 “ ‘Nʼihi na i sitere nʼiro ahụ dị gị nʼobi siterịị na mgbe ochie rara ụmụ Izrel nye nʼaka mma agha, nʼoge ha nọ na-ahụju anya, nʼoge ahụ ịta ahụhụ nke ajọ omume ruru nʼogo dị ukwuu.
EZE 35:6 Nʼihi nke a, ebe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, aga m enyefe gị nʼaka ndị na-awụsi ọbara. Ọbara ga-achụkwa gị ọsọ. Ebe ọ bụ na ị kpọghị iwusi ọbara asị, ọbara a ga-awụsị nʼime gị ga-achụ gị ọsọ.
EZE 35:7 Aga m eme ka ugwu Sia ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Aga m esitekwa nʼime ya bipụ ndị na-abata abata, na ndị na-apụ apụ.
EZE 35:8 Ugwu ukwu gị niile ga-ejupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ, ugwu nta niile, na ndagwurugwu niile na mgbawara niile dị nʼala ga-ejupụta nʼozu ndị e ji mma agha gbuo.
EZE 35:9 Ị gaghị ebulitekwa isi gị ọzọ. Ebe tọgbọrọ nʼefu ka ị ga-abụ ruo ebighị ebi. A gaghị ewuzikwa obodo gị ọzọ. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 35:10 “ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Mba abụọ ndị a, na ala abụọ ndị a ga-abụ nke anyị, anyị ga-enweta ha,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ.
EZE 35:11 Nʼihi ya, ebe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, aga m emeso gị mmeso dịka ịba ụba nke iwe gị na ekworo gị si dị, bụ nke i gosiri mgbe ị kpọrọ ha asị. Aga m emekwa ka ha mata onye m bụ, mgbe m kpesịrị gị ikpe.
EZE 35:12 Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị nụrụ okwu ọjọọ ndị ahụ niile i kwuru megide ugwu Izrel niile, na-asị, “E meela ha ebe tọgbọrọ nʼefu, ewerela ha nyefee anyị nʼaka ka anyị dọgbuo ha.”
EZE 35:13 Unu nyakwara isi megide m, kwuo okwu kwugide m dịka o si dị unu mma. Anụkwara m ihe niile unu kwuru.
EZE 35:14 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Mgbe ụwa niile na-aṅụrị ọṅụ ka m ga-eme ka ị ghọọ mkpọmkpọ ebe.
EZE 35:15 Dịka ị ṅụrịrị ọṅụ mgbe ihe nketa Izrel ghọrọ mkpọmkpọ ebe, otu a ka m ga-esi mesoo gị mmeso. Ị ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ nʼefu, gị ugwu Sia, gị na ndị Edọm niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
EZE 36:1 “Nwa nke mmadụ, buo amụma nye ugwu niile dị nʼIzrel, na-asị ha, ‘Ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị.
EZE 36:2 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị iro unu ekwuola megide unu sị, “Ahaa! Ebe niile dị elu nke mgbe ochie aghọọla ihe nnweta anyị.” ’
EZE 36:3 Nʼihi ya, buo amụma sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na ha emeela ka unu tọgbọrọ nʼefu, chụgharịa unu ọsọ nʼakụkụ niile, mekwaa ka unu ghọọrọ mba niile ihe nnweta, ma meekwa ka unu bụrụ ndị a na-ekwujọ, na ndị a na-akọcha,
EZE 36:4 nʼihi ya, unu ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa ugwu ukwuu na ugwu nta niile, na mgbawara niile dị nʼala, na ndagwurugwu niile, na ebe niile tọgbọrọ nʼefu, na obodo ndị ahụ niile ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya, nke ndị mba ọzọ kwakọọrọ ihe dị ha nʼime, ma jirikwa ha na-eme ihe ọchị.
EZE 36:5 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nke obi m ka m ji kwuo okwu megide mba ndị ọzọ, ma megidekwa Edọm, nʼihi na ọ bụ site nʼịkpọ asị nke obi ha ka ha ji mee ka ala m bụrụ ihe nnweta ha, ka ha si otu a kposaa, ma chịkọrọkwa ihe niile dị nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ala ahụ.’
EZE 36:6 Nʼihi nke a, buo amụma banyere Izrel, gwa ugwu ukwu ya na ugwu nta ya niile, na mgbawara ala ya, na ndagwurugwu ya niile, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, ọ bụ site nʼọnụma nke ekworo ka m ji ekwu okwu ndị a, nʼihi na unu ahụọla ahụhụ site na nlelị ndị mba ọzọ na-elelị unu.
EZE 36:7 Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, eweliri m aka m elu ṅụọ iyi na mba ndị a gbara unu gburugburu ga-anọkwa nʼọnọdụ ihere.
EZE 36:8 “ ‘Ma unu, ugwu niile nke Izrel ga-awapụta ngalaba, mịakwa mkpụrụ nke ndị m ga-eri, nʼihi na oge ha ga-alọghachi adịghịkwa anya.
EZE 36:9 Lee, mụ onwe m dịnyeere unu; aga m abịa inyere unu aka, nʼihi na a ga-akọgharịkwa unu, kụọkwa mkpụrụ nʼime unu.
EZE 36:10 Aga m emekwa ka ọnụọgụgụ ndị ga-ebi nʼime unu baa ụba, ọ bụladị ụlọ Izrel niile. Ha ga-ebikwa nʼobodo niile, wugharịakwa ebe niile e tikpọrọ etikpọ.
EZE 36:11 Aga m eme ka ọnụọgụgụ ndị mmadụ, na anụ ụlọ dị nʼime gị baa ụba. Ha ga-amụbakwa, jupụtakwa ebe niile. Ndị mmadụ ga-ebikwa nʼelu gị dịka ha si biri nʼoge gara aga. Aga m emekwa ka ihe gaara ha nke ọma karịa ka ọ dị na mbụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 36:12 Aga m eme ka ndị m, ndị m bụ Izrel, biri nʼime unu. Unu ga-abụ ihe nweta ha, unu ga-aghọkwara ha ihe nketa. Unu agakwaghị agbaba ha aka ụmụ ọzọ.
EZE 36:13 “ ‘Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼihi na ụfọdụ mba na-ekwutọ gị na-asị, “Ị bụ ala na-eri ụmụ ya, ala na-agbaba ndị ya aka ụmụ.”
EZE 36:14 Nʼihi nke a, ị gaghị erikwa mmadụ ọzọ. Ị gaghị agbawakwa mba gị aka ụmụ ọzọ. Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 36:15 Agaghị m emekwa ka ị nụrụ mkparị nke ndị mba ọzọ na-akparị gị. Ị gaghị anọkwa ọnọdụ nke ga-eme ka ndị mba ọzọ lelịa gị, maọbụ nọọ ọnọdụ nke ga-eme ka ị sọọ ngọngọ. Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
EZE 36:16 Ọzọkwa, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,
EZE 36:17 “Nwa nke mmadụ, mgbe ụmụ Izrel bi nʼala nke aka ha, ha merụrụ ya, site na ndụ ọjọọ ha, na omume ha. Ndụ ọjọọ ha nʼihu m, dị ka adịghị ọcha nke nwanyị nʼoge ọ nọ na nsọ ya, nʼọnwa niile.
EZE 36:18 Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m, nʼihi na ha na-awụsi ọbara nʼala ahụ, jirikwa arụsị ha na-emerụ ya.
EZE 36:19 Achụsasịrị m ha na mba dị iche iche. Otu a ka m si kpee ha ikpe nʼihi ụzọ ọjọọ ha, na omume ọjọọ ha.
EZE 36:20 Ma ebe niile ha gara nʼetiti mba niile, ha mere ka aha nsọ m gharakwa ịdị nsọ, nʼihi na a na-ekwu banyere ha, sị, ‘Ndị a bụ ndị nke Onyenwe anyị, ma agbanyeghị nke a, ha sitere nʼala ya pụọ.’
EZE 36:21 Ihe na-ewutekwa m bụ aha nsọ m, nke ụlọ Izrel mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile bụ ebe ha gara.
EZE 36:22 “Ya mere, gwa ụlọ Izrel, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụghị nʼihi na unu, ụlọ Izrel, ka m ji na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ nʼihi aha nsọ m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile dị iche iche ebe ndị unu gara.
EZE 36:23 Aga m eme ka ịdị nsọ nke aha ukwuu m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile, pụta ìhè. Mgbe ahụ, mba niile ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, mgbe a ga-edo m nsọ site nʼime unu nʼanya ha.
EZE 36:24 “ ‘Nʼihi na aga m esi na mba niile dị iche iche kpọpụta unu. Aga m achịkọta unu site nʼala niile, mee ka unu bata nʼala unu.
EZE 36:25 Aga m efekwasị unu mmiri dị ọcha, unu ga-adịkwa ọcha. Aga m eme ka unu dị ọcha site na-adịghị ọcha unu niile, na site nʼikpere arụsị unu niile.
EZE 36:26 Aga m enye unu obi ọhụrụ, kenyekwa unu mmụọ ọhụrụ. Aga m ewepụ obi nkume nke mmehie dị nʼime unu, nye unu mkpụrụobi nke anụ ahụ.
EZE 36:27 Aga m etinyekwa mmụọ m nʼime unu, mee ka unu gbaso ụkpụrụ m niile ma lezie anya mekwaa ihe niile m nyere nʼiwu.
EZE 36:28 Unu ga-ebikwa nʼala ahụ nke m nyere nna unu ha. Unu ga-abụ ndị m, aga m abụkwa Chineke unu.
EZE 36:29 Aga m azọpụta unu site na-adịghị ọcha unu niile. M ga-akpọ mkpụrụ ubi, mee ka o rie nne nke ukwu, agaghị m emekwa ka ụnwụ dakwasị unu ọzọ.
EZE 36:30 Aga m emekwa ka mkpụrụ osisi na ihe owuwe ubi baa ụba nke ukwuu, ka unu gharakwa ịnata ihere ọzọ nʼihi ụnwụ, nʼetiti mba niile dị iche iche.
EZE 36:31 Mgbe ahụ, unu ga-echeta ụzọ ọjọọ unu niile na omume ọjọọ unu niile, unu ga-asọkwa onwe unu oyi nʼihi mmehie unu na ihe arụ niile unu mere.
EZE 36:32 Ma achọrọ m ka unu mata na ọ bụghị nʼihi mma unu ka m ji na-eme ihe ndị a. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Unu ụlọ Izrel, ihere kwesiri ime unu nʼihi omume ọjọọ unu mere.
EZE 36:33 “ ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ m ga-eme ka ị dị ọcha site na mmehie gị niile, aga m eme ka unu lọghachi nʼobodo unu biri, a ga-ewugharịkwa ebe niile tọgbọrọ nʼefu.
EZE 36:34 Ala ubi ndị ahụ nke tọgbọrọ nʼefu agaghị atọgbọkwa nʼefu nʼihu anya ndị na-agafe agafe. A ga-akọkwa ha niile.
EZE 36:35 Mgbe ahụ, ha ga-asị, “Ala a, nke naara atọgbọ nʼefu, aghọọla ubi a gbara ogige, nke yiri ogige Iden. Leekwa na obodo niile ndị ahụ e tikpọrọ etikpọ, ka e wuzikwara, werekwa mgbidi gbaa ha ogige. Ugbu a, ndị mmadụ jupụtakwara nʼime ha.”
EZE 36:36 Mgbe ahụ, mba niile gbara unu gburugburu, bụ ndị fọdụrụ, ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị wuziri ebe niile e tikpọrọ etikpọ, kụọkwa mkpụrụ nʼebe niile tọgbọrọ nʼefu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ekwuola, aga m emekwa ya.’
EZE 36:37 “Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ọzọkwa, aga m ege ntị, zaa ekpere ụlọ Izrel, mezuoro ha arịrịọ ha. Aga m eme ka ha baa ụba dịka igwe anụ ụlọ,
EZE 36:38 dịka igwe anụ ụlọ, nke na-ejupụta na Jerusalem nʼoge mmemme ya niile a kara aka. Nʼụzọ dị otu a, obodo niile e tikpọrọ etikpọ ga-ejupụtakwa na mmadụ ọzọ. Mgbe ahụ ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
EZE 37:1 Aka nke Onyenwe anyị dịkwasịrị m, o sitekwara nʼike Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bulie m, debe m nʼetiti ndagwurugwu nke jupụtara nʼọkpụkpụ.
EZE 37:2 O mere ka m jegharịa nʼetiti ha. Ahụrụ m ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, nke dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, ka ha ghasa na ndagwurugwu ahụ.
EZE 37:3 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a ha pụrụ ịdị ndị ọzọ?” Asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ọ bụ naanị gị onwe gị maara.”
EZE 37:4 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ọkpụkpụ ndị ahụ, gwa ha, ‘Unu ọkpụkpụ niile kpọrọ nkụ, geenụ ntị nʼokwu nke Onyenwe anyị.
EZE 37:5 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa ọkpụkpụ ndị a. Lee, aga m eme ka ume baa nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ.
EZE 37:6 Aga m etinyekwasị unu akwara, na anụ ahụ, werekwa akpụkpọ ahụ kpuchie unu. Aga m etinye ume nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
EZE 37:7 Ya mere, eburu m amụma dịka e sị nye m nʼiwu. Mgbe m nọ na-ebu amụma ahụ, anụrụ m ụzụ, ụzụ mkpọtụ. Ma lee, ọkpụkpụ ndị ahụ niile bịara ibe ha nso; ọkpụkpụ malitekwara ijikọta onwe ha ọnụ.
EZE 37:8 Mgbe m nọkwa na-ele anya, lee, ahụrụ m ka akwara na anụ ahụ malitere ịbịakwasị nʼelu ọkpụkpụ ndị ahụ, akpụkpọ ahụ kpuchikwara elu ha. Ma nʼoge a ume ọbụla adịghị nʼime ha.
EZE 37:9 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ifufe; buo amụma, nwa nke mmadụ, sị ifufe, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: site nʼakụkụ anọ nke ụwa bịa, gị ume na-enye ndụ, kukwasị ndị a e gburu egbu ka ha dịkwa ndụ ọzọ.’ ”
EZE 37:10 Ya mere, eburu m amụma dịka o si nye m nʼiwu. Ume ndụ banyekwara nʼime ha. Ha niile dịịrị ndụ, bilie ọtọ, guzo nʼụkwụ ha, ghọọ usuu ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.
EZE 37:11 Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a nọchiri anya ụlọ Izrel niile. Ha na-asị, ‘Anyị aghọọla ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, olileanya niile agwụkwala, anyị abụrụla ndị e bipụrụ.’
EZE 37:12 Nʼihi ya, buo amụma gwa ha, ‘otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ndị m, aga m emeghe ili unu, si nʼebe ahụ wepụta unu. Aga m eme ka unu lọghachitakwa nʼala Izrel.
EZE 37:13 Nʼikpeazụ, mgbe m meghere ili unu mee ka unu si nʼime ya pụta, unu bụ ndị m ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 37:14 Aga m etinye Mmụọ m nʼime unu, unu ga-adị ndụ, lọghachikwa nʼala unu ọzọ. Unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya, meekwa ya, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
EZE 37:15 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 37:16 “Nwa nke mmadụ, were osisi dee ihe ndị a nʼelu ya, ‘Osisi a nọchiri anya Juda na ndị Izrel e kekọtara ya na ha ọnụ.’ Werekwa osisi ọzọ deekwa okwu ndị a nʼelu ya. ‘Osisi a nọchiri anya Ifrem, na Josef, na ndị Izrel niile e jikọtara ha na ndị a ọnụ.’
EZE 37:17 Jidekọtaa osisi abụọ ndị a ọnụ, mee ka ha bụrụ otu osisi nʼaka gị.
EZE 37:18 “Mgbe ndị gị jụrụ gị, ‘Ị gaghị egosi anyị ihe nke a pụtara?’
EZE 37:19 gwa ha, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Lee, agaje m iwere osisi Josef, nke dị Ifrem nʼaka, nke bụkwa ihe nọchiri anya ebo ụfọdụ ndị Izrel, jidekọtaa ya na osisi nọchiri anya Juda, mee ha ka ha ghọọ otu osisi, bụrụkwa otu nʼaka m.’
EZE 37:20 Were mkpirisi osisi ndị ahụ i dere ihe nke dị nʼaka gị, gosi ha,
EZE 37:21 ma gwakwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m esite na mba niile ndị Izrel jere biri kpọpụta ha. Aga m achịkọtakwa ha site nʼakụkụ niile, kpọbata ha nʼala nke aka ha.
EZE 37:22 Aga m eme ha ka ha bụrụ otu mba nʼala ahụ, nʼugwu niile nke Izrel. Ha ga-enwe naanị otu eze nke ga-achị ha niile. Ha agaghị abụkwa mba abụọ maọbụ alaeze abụọ ọzọ.
EZE 37:23 Ha agaghị ejikwa arụsị ha niile, maọbụ ihe a pịrị apị rụrụ arụ, maọbụ jiri ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche merụọ onwe ha ọzọ. Nʼihi na aga m azọpụta ha site na ịlaghachi azụ nʼụzọ mmehie ha niile, meekwa ka ha dị ọcha. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.
EZE 37:24 “ ‘Ohu m, Devid, ga-abụ eze ga-achị ha, ha ga-enwekwa otu onye ọzụzụ atụrụ. Ha ga-edebezu iwu m niile, na ụkpụrụ m niile.
EZE 37:25 Ha ga-ebi nʼala ahụ m nyere ohu m Jekọb, ala ebe nna nna ha biri. Ha na ụmụ ha ga-ebi nʼime ya. Ụmụ ụmụ ha ruo ọgbọ niile ga-ebikwa nʼime ya. Ohu m Devid ga-abụ eze ha ruo ebighị ebi.
EZE 37:26 Mụ na ha ga-agba ndụ udo, ọgbụgba ndụ nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Aga m agọzi ha, mee ka ha baa ụba. Nʼetiti ha kwa ka ụlọnsọ m ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.
EZE 37:27 Ebe obibi m ga-abụkwa nʼetiti ha. E, aga m abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.
EZE 37:28 Mgbe ụlọnsọ m ga-adị nʼetiti ha ruo ebighị ebi, mba niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-edo Izrel nsọ.’ ”
EZE 38:1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
EZE 38:2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼala Magog, bukwaa amụma megide Gog, bụ onyeisi nke Meshek na Tubal. Buo amụma megide ya,
EZE 38:3 sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ana m edo onwe m imegide gị, Gog, eze ukwu ndị Meshek na Tubal.
EZE 38:4 Aga m echigharị gị, tinye gị nko nʼagba gị abụọ, jiri ya kpụpụta gị na usuu ndị agha gị niile, na ịnyịnya gị, na ndị na-agba ịnyịnya gị na ihe agha ha, na usuu ndị agha gị niile, ndị ji ọta ukwu na ọta nta, ndị niile na-ejide mma agha ha.
EZE 38:5 Peshịa na Itiopia, na Put, ga-esonyere ha, ha niile ga-ejikwa ọta ha na okpu agha ha.
EZE 38:6 Goma na usuu ndị agha ya niile, na ndị agha Bet Togama ndị si nʼakụkụ ugwu, dị ebe dị anya na ọtụtụ ndị mba ọzọ ga-eso gị.
EZE 38:7 “ ‘Jikere! Jikere onwe gị, gị onwe gị na usuu ndị agha ahụ nọ gị gburugburu, gị Gog, bụrụkwa onyendu ha.
EZE 38:8 Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, a ga-akpọlite gị ibu agha. Nʼogologo oge dị nʼihu, ị ga-ebuso ala ahụ agha bụ ala ahụ na-enwetaghachi onwe ya site na mbibi nke ibu agha; ala ahụ e si na mba dị iche iche chịkọtaa ndị bi nʼime ya, mee ka ha birikwa nʼugwu niile nke Izrel ahụ naara atọgbọ nʼefu. E bulatara ha site na mba dị iche iche, ma ugbu a, ha anọrọla nʼudo.
EZE 38:9 Gị onwe gị, na ndị agha gị niile, na ọtụtụ ndị mba ahụ dị iche iche ndị na-eso gị, jiri ọsọ, dịka ikuku siri ike, rigoo, kpuchie ala ahụ dịka igwe ojii.
EZE 38:10 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ, echiche ọjọọ ga-abata nʼobi gị, mgbe ị na-atule ọtụtụ ihe dị iche iche nʼobi gị.
EZE 38:11 Ị ga-asị, “Aga m ebuli megide nʼala na-enweghị mgbidi, aga m awakpo ndị nọ nʼudo na-adịghị atụ anya nsogbu ọbụla, ha niile bụ ndị bi nʼebe na-enweghị mgbidi, ha enweghịkwa ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.
EZE 38:12 Aga m akwata ihe nkwata, lụtakwa ihe nlụta nʼagha. Aga m eweli aka m megide obodo ndị a niile e wugharịrị ewugharị, megidekwa ndị a niile e si na mba dị iche iche chịkọtaa, bụ ndị bara ọgaranya nʼanụ ụlọ na ngwongwo dị iche iche, ndị bikwa nʼetiti ala a.”
EZE 38:13 Ndị Sheba na Dedan, na ndị ahịa Tashish niile, na ụmụ ọdụm ya niile ga-ajụ gị, “Ị bịara ịkwata ihe nkwata? Ị chịkọtara usuu ndị agha gị nʼihi ịkwara ihe nlụta, na iburu ọlaọcha na ọlaedo, na ịchịrị igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha, na ịkwakọrọ ihe ha nwere nʼike?” ’
EZE 38:14 “Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma sị Gog, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ mgbe ndị m bụ Izrel na-ebi nʼudo nʼala ha, ọ bụ na ị gaghị ahụta ya?
EZE 38:15 Ị ga-esi nʼebe obibi gị dị nʼugwu bịa, gị na ọtụtụ mba dị iche iche, ndị na-anọkwasị nʼịnyịnya. Ha ga-adị ukwuu, bụrụ ndị agha dị ike.
EZE 38:16 Unu ga-abịa ibuso ndị m Izrel agha, kpuchie ala ha dịka igwe ojii. Nʼụbọchị ndị ahụ dị nʼihu, aga m eme ka gị, bụ Gog, bịa buso ala m agha, ka mba niile si otu a mata m, mgbe m mere ka ịdị nsọ m pụta ìhè nʼanya ha site nʼihe m ga-eme.’
EZE 38:17 “ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ gị, bụ onye ahụ m kwuru okwu banyere ya nʼoge gara aga, site nʼọnụ ndị ohu m, bụ ndị amụma Izrel, ndị buru amụma ọtụtụ afọ na mgbe ahụ, sị, na m ga-eme ka ị megide ndị m.
EZE 38:18 Lee ihe ga-eme nʼụbọchị ahụ. Mgbe Gog busoro ala Izrel agha, ọ ga-esi otu a kpalie iwe m dị ọkụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
EZE 38:19 Nʼihi na esitere m nʼịnụ ọkụ nke obi m, na oke iwe m kwupụta sị, na ala ọma jijiji dị ukwuu ga-adị nʼIzrel nʼụbọchị ahụ.
EZE 38:20 Azụ niile dị nʼoke osimiri, na anụ ufe nke eluigwe, na anụ ọhịa, na ihe niile na-akpụ akpụ, na mmadụ niile nọ nʼelu ụwa ga-ama jijiji nʼihu m. A ga-akwatu ugwu niile, ebe niile dị mkputamkpu ga-adarukwa ala.
EZE 38:21 Aga m akpọlite mma agha ka o megide Gog nʼugwu m niile. Onye ọbụla ga-ejikwa mma agha ya megide nwanne ya nwoke. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
EZE 38:22 Aga m eji ọrịa na-efe efe na iwusi ọbara kpee ya ikpe. Aga m awụkwasị ya na ndị agha ya na ọtụtụ mba dị iche iche ndị ahụ so ya, oke mmiri ozuzo na akụmmiri, na nkume ọkụ.
EZE 38:23 Otu a ka m ga-esi gosi ịdị ukwuu m, na ịdị nsọ nke aha m. Aga m emekwa ka a mara m nʼanya mba niile dị iche iche. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
EZE 39:1 “Ma gị, nwa nke mmadụ buo amụma megide Gog, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m emegide gị, Gog, onyeisi nke Meshek na Tubal.
EZE 39:2 Aga m echigharị gị, kpụrụ gị na-aga. Aga m esi nʼebe dịkarịsịrị anya nʼakụkụ ugwu kpọta gị, ziga gị ka i buso ugwu niile nke Izrel agha.
EZE 39:3 Mgbe ahụ, aga m etichapụ ụta dị gị nʼaka ekpe, meekwa ka àkụ niile nke dị nʼaka nri gị dachapụ.
EZE 39:4 Nʼelu ugwu niile nke Izrel ka ị ga-ada, gị onwe gị, na usuu ndị agha gị niile, na mba niile dị iche iche ndị na-eso gị. Udele niile dị iche iche na anụ ọhịa niile ka m ga-enyefe anụ ahụ unu ka ha were unu mere ihe oriri.
EZE 39:5 Ị ga-ada nʼọhịa na-enweghị ebe nzobe, nʼihi na m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 39:6 Aga m awụkwasị ọkụ nʼahụ Magog, na nʼahụ ndị ahụ niile bi nʼudo, nʼọnụ mmiri niile. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
EZE 39:7 “ ‘Aga m eme ka amara aha nsọ m nʼetiti ndị m bụ Izrel. Agaghị m ekwekwa ka e lelịa aha nsọ m anya ọzọ. Mba niile dị iche iche ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nọ nʼIzrel.
EZE 39:8 Lee, ọ na-abịa, nʼezie, ọ ga-emekwa, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Nke a bụ ụbọchị ahụ nke m kwuru ihe banyere ya.
EZE 39:9 “ ‘Nʼoge ahụ, ndị bi nʼobodo niile nke Izrel ga-apụ tụtụkọtaa ngwa agha ndị ahụ, were fụnwue ọkụ, surekwaa ha ọkụ, ma ọta ukwu ma ọta nta niile, ụta na àkụ niile, ma mkpọ agha na ùbe niile. Ọ bụ afọ asaa ka ha ga-eji ha mere nkụ.
EZE 39:10 Ha agaghị akpatakwa nkụ site nʼọhịa ọzọ, maọbụ gbuta ha site nʼoke ọhịa, nʼihi na ha ga-eji ngwa agha ndị a mere ihe ịfụnwu ọkụ. Mgbe ahụ, ha ga-akwata ihe onwunwe nke ndị ahụ kwakọrọ ihe onwunwe ha nʼagha, lụtakwa ihe onwunwe nke ndị ahụ lụnara ha ihe onwunwe ha nʼike. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 39:11 “ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m enye Gog ebe olili ya nʼIzrel, nʼime ndagwurugwu si ọwụwa anyanwụ gawa nʼụzọ oke osimiri. Ọ ga-anọchi ụzọ ndị ije nʼihi na ebe ahụ ka a ga-eli Gog na usuu ndị agha ya. Ya mere, a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Hamọn Gog.
EZE 39:12 “ ‘Ọnwa asaa ka ọ ga-ewe ndị Izrel ili ozu ahụ niile, ime ka ala ahụ dị ọcha.
EZE 39:13 Ndị niile nke ala ahụ ga-eli ha, ụbọchị ahụ m ga-eme ka ebube m pụta ìhè ga-abụ ụbọchị ihe ncheta nye ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 39:14 A ga-ekewapụtakwa ndị ọrụ ha ga-abụ naanị ime ka ala ahụ dị ọcha. Ha ga-ejegharị nʼala ahụ niile, ha na ndị ọzọ, na-eli ozu ọbụla bụ ndị tọgbọrọ nʼala. “ ‘Mgbe ọnwa asaa zuru, ha ga-edo anya chọgharịa nʼala ahụ ma o nwere ebe ozu ọzọ dị.
EZE 39:15 Mgbe ahụ, ha na-ejegharị, ọ bụrụ na onye ọbụla achọta ọkpụkpụ mmadụ ọ ga-amanye ihe ịrịbama nʼakụkụ ya, ka ndị na-eli ozu hụ ha, kporokwa ha gaa na Ndagwurugwu Gog na ndị agha ya lie ha.
EZE 39:16 Ọzọkwa, otu obodo aha ya bụ Hamona, nke pụtara ọtụtụ, ga-adị nʼebe ahụ. Otu a ka ha ga-esi mee ka ala ahụ dị ọcha.’
EZE 39:17 “Nwa nke mmadụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, kpọọ ụmụ nnụnụ niile oku, na anụ ọhịa niile dị iche iche, sị ha, ‘Chịkọtaanụ onwe unu, site nʼakụkụ niile bịanụ nʼọchụchụ aja m, nke mụ onwe m na-achụ nʼihi unu, bụ aja dị ukwuu nke m na-achụ nʼelu ugwu niile dị nʼIzrel. Nʼebe ahụ ka unu ga-anọ taa anụ, ṅụọkwa ọbara.
EZE 39:18 Anụ ahụ ndị dị ike ka unu ga-eri, ọ bụkwa ọbara ndịisi niile nke ụwa ka unu ga-aṅụ, dịka a ga-asị na ha bụ ebule na ụmụ atụrụ, na mkpi, na oke ehi, anụ mara abụba nke si na Bashan.
EZE 39:19 Unu ga-erijukwa abụba afọ, ṅụbigakwa ọbara oke ruo mgbe ọ ga-ebu unu, site nʼaja mmemme nke m na-achụ nʼihi unu.
EZE 39:20 Afọ anụ ịnyịnya, na ụgbọala, na nke ndị dike, na nke ndị agha niile ga-eju unu na tebul m.’ Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
EZE 39:21 “Mgbe ahụ, aga m egosi ebube m na nsọpụrụ m nʼetiti mba niile dị iche iche. Mba niile ga-ahụkwa ahụhụ nke m tara ha, na aka m nke m tụkwasịrị ha.
EZE 39:22 Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ụlọ Izrel ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.
EZE 39:23 Mba niile ga-amatakwa na ọ bụ nʼihi mmehie ka e ji dọta Izrel nʼagha, buru ha jee mba dị iche iche. Ha ga-amata na ihe dị otu a dakwasịrị ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji zoo ihu m site nʼebe ha nọ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha niile dakwara site na mma agha.
EZE 39:24 Atara m ha ahụhụ dịka adịghị ọcha ha na ajọ omume ha si dị. Ezokwara m ihu m site nʼebe ha nọ.
EZE 39:25 “Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Aga m eme ka Jekọb a dọtara nʼagha lọta. Aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ndị Izrel niile. Aga m esitekwa nʼekworo mee ka aha m dịgide nsọ.
EZE 39:26 Ha ga-echezọkwa ihe ihere ha, na-ekwesighị ntụkwasị obi ha niile, nke ha gosiri m, mgbe ha biri nʼudo nʼala ha, na-enweghị onye na-eme ka ha tụọ egwu.
EZE 39:27 Mgbe m mere ka ha site na mba dị iche iche pụta, mgbe m sitere nʼala niile nke ndị iro ha kpọpụta ha, aga m esite na ha gosi ịdị nsọ m nye mba dị iche iche.
EZE 39:28 Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha. Ha ga-amata na ọ bụ ezie na ọ bụ m mere ka a dọta ha nʼagha buru ha jee mba dị iche iche, na m ga-achịkọta ha mee ka ha lọghachi nʼala nke aka ha. Ọ dịkwaghị onye a ga-ahapụ na mba ọzọ.
EZE 39:29 Agaghị m ezokwa ihu m ọzọ nʼebe ha nọ, nʼihi na aga m awụkwasị ụlọ Izrel Mmụọ m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
EZE 40:1 Nʼafọ nke iri abụọ na ise nke e mere ka anyị biri na mba ọzọ, na mbido afọ ahụ, nʼụbọchị nke iri, nke ọnwa ahụ nʼafọ nke iri na anọ site na mgbe obodo ahụ dara, nʼotu ụbọchị ahụ ka aka Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ. O mere ka m bịa nʼebe ahụ.
EZE 40:2 Nʼọhụ dị iche iche Chineke mere ka m hụ, o buuru m gaa nʼala Izrel, debe m nʼelu ugwu dị elu nke ukwu, ebe m nọ hụ ihe dịka obodo a na-ewu ọhụrụ, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu ahụ.
EZE 40:3 O mere ka m bịaruo nʼebe ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwoke nke ụdịdị ya na-enwu dịka bronz ka o guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ọ na-ejide eriri akwa ọcha, na osisi e ji atụ ihe nʼaka ya.
EZE 40:4 Nwoke ahụ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, lezie anya nke ọma, gekwaa ntị tinyekwa ihe niile m gaje igosi gị nʼobi, nʼihi na-akpọtara m gị nʼebe a nʼihi ka ịhụ ihe ndị a. Gwakwa ụmụ Izrel ihe niile ị hụrụ.”
EZE 40:5 Mgbe ahụ, ahụrụ m mgbidi gbara ụlọnsọ ahụ gburugburu. Ịdị ogologo nke osisi ihe ọtụtụ nke dị nʼaka nwoke ahụ, ruru mita atọ na ụma abụọ, nke ọbụla nʼime ha ruru iri sentimita ise na atọ. Ọ tụrụ mgbidi ahụ, chọpụta na ịla elu ya dị mita atọ na ọkara. Ịsa mbara ya dịkwa mita atọ na ọkara.
EZE 40:6 Emesịa, ọ gara nʼọnụ ụzọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ, rigoro nʼihe nrigo elu, tụọ ala ala ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ahụ. Obosara ya dị mita atọ na ọkara.
EZE 40:7 Oghere dị nʼụlọ ahụ nke bụ ebe ndị nche na-anọ dị mita atọ nʼọkara nʼobosara. Mgbidi dị nʼetiti ha dị mita abụọ na ụma asaa nʼigbidi. Ebe e si abata na mpụta ọnụ ụzọ ama nke chere ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, dị mita atọ nʼọkara nʼomimi.
EZE 40:8 O jikwa ihe ọtụtụ tụọ ebe mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama,
EZE 40:9 ọ dị mita anọ na ụma abụọ nʼomimi. Ogidi dị nʼakụkụ ya dị otu mita nʼigbidi. Ebe mpụta ọnụ ụlọ nke ụzọ ama ya chere ihu nʼụlọnsọ ukwu.
EZE 40:10 Nʼime ọnụ ụzọ ama nke ọwụwa anyanwụ, e nwere oghere atọ dị nʼakụkụ ọbụla, oghere atọ ndị ahụ ha nʼotu. Ihu akụkụ aja ya niile nke chere ha ihu bụkwa otu nʼọtụtụ.
EZE 40:11 Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara nke mbata ọnụ ụzọ ama ahụ, ọ dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, na mita isii na ụma itoolu nʼogologo.
EZE 40:12 Nʼihu oghere niile nke ụlọ ahụ e nwere mgbidi dị otu ọkara mita nʼịdị elu ya. Akụkụ anọ nke oghere ndị a ha otu. Ha ruru mita atọ mita atọ.
EZE 40:13 Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara ọnụ ụzọ ama ahụ, site nʼelu ụlọ nke otu ime ụlọ ruo nʼelu ụlọ nke ime ụlọ chere ya ihu; obosara ya dị mita iri na atọ, site nʼotu oghere ruo nʼoghere nke chere ya ihu.
EZE 40:14 Ọ tụrụ ogologo ogidi niile dị nʼakụkụ nʼime mgbidi ọnụ ụzọ ama ụlọ ahụ, chọpụta na ọ dị iri mita atọ na abụọ, ọ bụladị ruo nʼakụkụ mgbidi nke chere ihu nʼọnụ ụzọ ama ogige ahụ.
EZE 40:15 Site nʼihu ọnụ ụzọ ama mbata ahụ, ruo nʼebe ngwụcha nke ọnụ ụzọ dị na mpụta ọnụ ụlọ ya dị iri mita abụọ na asaa.
EZE 40:16 Ọnụ ụlọ ndị ahụ niile nwere oghereikuku dị warawara nʼakụkụ aja ụlọ ha, dịka mpụta ọnụ ụlọ ahụ nwekwara; oghereikuku ndị a dị gburugburu dị nʼime, nʼetiti ọnụ ụlọ ndị a. Nʼaja ụlọ ndị a niile, e nwere oyiyi nkwụ dị iche iche e sere nʼelu ha.
EZE 40:17 Ọ kpọbatara m nʼogige dị nʼezi. Nʼebe ahụ, ahụrụ m ụfọdụ ọnụụlọ dị na pevumentị e wunyere gburugburu ogige ahụ niile. Ha dị iri ọnụụlọ atọ dị nʼogologo pevumentị ahụ.
EZE 40:18 Ebe nzọkwasị ụkwụ a gara ogologo ruo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, ogologo ya na ọnụ ụzọ ama ahụ ha, nke a bụ pevumentị nke dịkarịrị ala.
EZE 40:19 Mgbe ahụ, ọ tụrụ ịdị ogologo ya, site nʼime ọnụ ụzọ ama nke dịkarịrị ala ruo nʼọnụ ụzọ nke ime ogige, o ruru iri mita ise na atọ nʼakụkụ ihu anyanwụ nakwa nʼakụkụ ugwu.
EZE 40:20 Ọ tụrụ ogologo na obosara ọnụ ụzọ nke dị nʼugwu, nke e si abanye nʼogige dị nʼezi.
EZE 40:21 Ime ụlọ ya dị ọnụ ụlọ atọ nʼakụkụ ya ọbụla. Akụkụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ya, bụ otu ọtụtụ dịka ọtụtụ nke ọnụ ụzọ ama mbụ. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.
EZE 40:22 Oghereikuku ya, mpụta ọnụ ụzọ ya na osisi nkwụ e sere nʼahụ aja ụlọ ahụ niile, dịka e mere nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ, bụ otu ọtụtụ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asaa dị nke e si aga na mpụta ọnụ ụlọ ahụ na ncherita ihu ogige ezi.
EZE 40:23 Otu ọnụ ụzọ dị nke gara nʼogige dị nʼime, nke chere ihu ọnụ ụzọ mbata dị nʼugwu, dịka ọ dịkwa nʼakụkụ nke ọwụwa anyanwụ. Ọ tụrụ site nʼotu ọnụ ụzọ ama ruo na nke chere ya ihu, ọ dị iri mita ise na anọ.
EZE 40:24 Mgbe ahụ, o duuru m gaa nʼakụkụ ndịda, a hụrụ m ọnụ ụzọ mbata ndịda. Ọ tụrụ tụọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ahụ na mpụta ọnụ ụlọ ya, chọpụta na ya na ndị ọzọ bụ otu ọtụtụ.
EZE 40:25 Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghereikuku dị warawara gbaa gburugburu, dịka e nwere na ndị ọzọ niile. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ
EZE 40:26 Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asaa dịkwa iji rigoo ya, mpụta ọnụ ụlọ ya dịkwa na ncherita ihu ha, o nwekwara ihe ịchọ mma osisi nkwụ e sere nʼahụ akụkụ aja ahụ, otu nʼotu akụkụ, nke ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ.
EZE 40:27 Ogige nke dị nʼime, nwekwara ọnụ ụzọ ama nke na-echere ihu na ndịda. Ọ tụrụ site nʼotu ọnụ ụzọ ama ruo na nke chere ya ihu, ọ dị iri mita ise na anọ.
EZE 40:28 O duuru m site nʼọnụ ụzọ dị na ndịda banye nʼogige dị nʼime. Ọ tụrụ ọnụ ụzọ mbata a hụ na ya na ọnụ ụzọ nke dị ọzọ bụ otu ọtụtụ.
EZE 40:29 Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.
EZE 40:30 Mpụta ọnụ ụlọ nke ndị dị gburugburu ogige nke ime, dị iri mita na atọ nʼobosara, na mita abụọ na ụma atọ nʼịdị omimi.
EZE 40:31 Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi, oyiyi osisi nkwụ ka eji chọọ ogidi ọnụ ụlọ ahụ mma, ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.
EZE 40:32 Ọ kpọbatakwara m nʼogige dị nʼime site nʼọnụ ụzọ mbata nke ọwụwa anyanwụ. Ọ tụkwara ọnụ ụzọ ama ahụ, chọpụta na ya na ndị ọzọ bụkwa otu ọtụtụ.
EZE 40:33 Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya niile bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.
EZE 40:34 Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi. Oyiyi nkwụ e sere ese ka eji chọọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ya mma, nʼakụkụ nke a, nakwa nʼakụkụ nke ọzọ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.
EZE 40:35 O mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama mbata nke ugwu. Ọ tụrụ ya, chọpụta na ọtụtụ ya dịkwa ka nke ndị ọzọ,
EZE 40:36 dịka ọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya, ha niile nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ
EZE 40:37 Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi. Oyiyi nkwụ e sere ese ka eji chọọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ya mma, nʼakụkụ nke a, nakwa nʼakụkụ nke ọzọ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.
EZE 40:38 Otu ọnụụlọ nke nwere ọnụ ụzọ dịkwa nʼakụkụ mpụta ọnụ ụlọ nke ime ime ọnụ ụzọ ama ọbụla, ebe a na anọ asacha anụ aja nsure ọkụ niile.
EZE 40:39 Nʼime mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ka tebul abụọ dị nʼotu akụkụ, abụọ nke ọzọ dịkwa nʼakụkụ nke ọzọ nke ọnụ ụlọ ahụ. Nʼelu ha ka a na-egbu anụ e ji achụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja mmehie, maọbụ onyinye nʼihi aja ikpe ọmụma.
EZE 40:40 Nʼakụkụ mgbidi ezi nke mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, nʼakụkụ ihe nrigo nke dị na mbata ọnụ ụzọ ugwu, e nwere tebul abụọ, nʼakụkụ nke ọzọkwa nke ihe nrigo ahụ, e nwekwara tebul abụọ nʼebe ahụ.
EZE 40:41 Ya mere, e nwere tebul anọ nʼotu akụkụ ihe nrigo ahụ, nwekwa anọ nʼakụkụ nke ọzọ ya, ya bụ, tebul asatọ ma agụkọta ya ọnụ, ebe a na-anọ egbu anụ e ji achụ aja.
EZE 40:42 E nwekwara tebul anọ ndị ọzọ nʼime ọnụ ụlọ ahụ e ji nkume a wara awa wuo. Nʼelu ya ka a na-anọ akwado anụ a ga-eji chụọ aja nsure ọkụ. Ịdị elu tebul ndị a bụ iri sentimita asatọ. Obosara elu ha nʼakụkụ niile dị iri sentimita ise na atọ. Ngwongwo niile e ji egbu anụ e ji achụ aja na-adị nʼelu tebul ndị a.
EZE 40:43 E ji nko nke ịdị ogologo ya dị sentimita itoolu ejigidesi tebul ndị ahụ ike nʼahụ aja ụlọ. Nko ndị a dị gburugburu tebul ndị ahụ. Ọ bụkwa nʼelu tebul ndị a ka a na-edebe anụ niile e ji enye onyinye.
EZE 40:44 Nʼime ogige dị nʼime, e nwere ọnụụlọ abụọ nke nwere ụzọ e si abanye nʼogige dị nʼime. Otu dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, chee ihu nʼọdịda anyanwụ, nke ọzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼọdịda anyanwụ, chee ihu nʼugwu.
EZE 40:45 Ọ gwara m, “Ọnụụlọ ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼugwu bụ nke ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu.
EZE 40:46 Ọnụụlọ nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama chere ihu nʼugwu, bụ nke ndị nchụaja ndị na-eche ebe ịchụ aja nche. Ndị a bụ ụmụ ụmụ Zadọk. Ọ bụ naanị ha ka e kwere ka ha nwee ike ịbịaru Onyenwe anyị nso, ijere ya ozi site nʼetiti ebo Livayị niile.”
EZE 40:47 Mgbe ahụ, ọ tụrụ ogige ime ahụ, chọpụta na ogologo ya dị iri mita ise na asatọ. Obosara ya bụkwa otu ihe ahụ. Ebe ịchụ aja dịkwa nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ.
EZE 40:48 O mere ka m bịaruo na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ọ tụrụ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ nke mpụta ọnụ ụlọ ahụ, o ruru mita abụọ na ụma atọ nʼobosara, nʼakụkụ ya abụọ. Ebe mbata ya ruru mita asaa na ụma anọ nʼobosara, ebe akụkụ aja ụlọ ahụ ruru otu mita na ụma isii nʼobosara, nʼotu akụkụ nakwa nʼakụkụ nke ọzọ ya.
EZE 40:49 Ebe mpụta ọnụ ụlọ ahụ dị ihe ruru mita iri na otu nʼobosara, sitekwa nʼazụ ruo nʼihu ya ruru mita isii na ụma anọ. Ọ bụ ihe nrigo iri ka eji arịgo ya. Ogidi dịkwa nʼakụkụ ọnụ ụzọ abụọ ahụ otu nʼakụkụ nke a ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ ya.
EZE 41:1 Mgbe ahụ, nwoke ahụ kpọbatara m nʼọnụ ụlọ ezumezu ahụ, ọ tụrụ akụkụ ọnụ ụzọ ya. Akụkụ ya ọbụla dị mita atọ na ụma abụọ, nke a bụ obosara ụlọ ikwu ahụ.
EZE 41:2 Obosara ọnụ ụzọ mbata ya dị mita ise na ụma atọ. Akụkụ aja abụọ nke ọnụ ụzọ ahụ dịkwa mita abụọ na ụma asaa. Ọ tụkwara ogologo ụlọ ezumezu ahụ; ya dịrị iri mita abụọ na otu nʼogologo, obosara ya dị mita iri na otu.
EZE 41:3 Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ime ebe nsọ ahụ, tụọ ogidi dị nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime ya, chọpụta na obosara nke ọbụla bụ otu mita na otu ụma, obosara ọnụ ụzọ ahụ nʼonwe ya dị mita atọ na ụma abụọ. Akụkụ aja nke ọnụ ụzọ ọbụla dị mita atọ na ụma asaa nʼobosara.
EZE 41:4 Ọ tụrụ ogologo ime ebe nsọ ahụ, ya dị mita iri na ọkara, obosara ya dịkwa mita iri na ọkara, nʼogologo ụlọ ezumezu ahụ. Ma ọ sịrị m, “Ebe a bụ Ebe Kachasị Nsọ.”
EZE 41:5 Ọ tụkwara mgbidi ụlọnsọ ukwu ahụ chọpụta na ịdị igbidi ya bụ mita atọ na ụma abụọ. E nwekwara ọnụụlọ ndị dị gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ, nke ọbụla dị mita abụọ na otu ụma nʼigbidi.
EZE 41:6 Ọnụụlọ nta ndị a dị nʼokpukpu atọ, nke ọbụla nʼelu ibe ya, okpukpu ọbụla nwere iri ọnụụlọ atọ. E nwere mgbidi gbara aja ụlọnsọ ahụ gburugburu nʼakụkụ niile, ka ha bụrụ ihe nkwado nye ọnụụlọ nta ndị a, ka ihe nkwado ndị a ghara ịbụ ihe a rụnyere nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ.
EZE 41:7 E wuru ọnụụlọ nta ndị a ka obosara ọnụụlọ ndị ahụ niile dị nʼelu ibe ha dị ukwuu karịa obosara ndị nke dị nʼokpuru ha. Nʼụzọ dị otu a, obosara ọnụụlọ niile dị nʼokpukpu nke abụọ dị ukwuu karịa nke dị nʼala; nke atọ dịkwa ukwuu karịa nke abụọ. E wukwara ebe e si arịgo site nʼokpukpu nke dịkarịsịrị ala rigoruo nʼọnụụlọ ndị kachasị elu, site nʼokpukpu nke dị nʼetiti.
EZE 41:8 Ahụrụ m na ụlọnsọ ukwu ahụ nwere ebe e wuliri elu nʼakụkụ ya niile. Ọ bụkwa ebe a dị elu ka e ji mee ntọala ọnụụlọ nta ndị ahụ niile. Ịdị ogologo nke ebe ahụ e wuliri elu bụ mita atọ na ụma abụọ.
EZE 41:9 Ịdị arọ nke mgbidi ọnụụlọ nta ndị a nʼakụkụ ezi bụ mita abụọ na ụma atọ. Ala tọgbọrọ nʼefu nʼetiti ọnụụlọ nta ụlọnsọ ukwu ahụ,
EZE 41:10 na ọnụụlọ ndị nchụaja dị mita iri na ọkara nʼobosara, gbaa gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ.
EZE 41:11 E nwere ọnụ ụzọ ndị a na-esi abanye nʼọnụụlọ nta ndị ahụ, site nʼala ahụ na-enweghị ihe arụrụ na ya, otu ọnụ ụzọ nʼakụkụ ugwu, nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Obosara ala nke fọdụrụ dị mita abụọ na ụma atọ nʼakụkụ niile gbaa gburugburu.
EZE 41:12 Ma ụlọ nke na-eche ihu nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, dị iri mita atọ na asaa nʼobosara, ịdị igbidi nke aja ụlọ ahụ dị mita abụọ na ụma atọ, gbaa gburugburu, ogologo ya dịkwa iri mita anọ na asatọ.
EZE 41:13 Mgbe ahụ, ọ tụrụ ụlọnsọ ukwu ahụ, ya dịrị iri mita ise na atọ, ogige ụlọnsọ, na ụlọ ahụ nakwa mgbidi ya, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo.
EZE 41:14 Obosara nke ogige ụlọnsọ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, tinyere ebe ihu ụlọnsọ ukwu ahụ, dị iri mita ise na atọ.
EZE 41:15 Ọ tụrụ ịdị ogologo nke ụlọ ahụ chere ihu nʼogige dị nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, tinyere ebe njegharị ya nke dị nʼakụkụ abụọ ya. Ọ dị iri mita ise na atọ. Ụlọ ezumezu ahụ, nʼime ebe nsọ ahụ, na mpụta nke ọnụ ụlọ, bụ nke chere ihu nʼogige ahụ,
EZE 41:16 ya na ọnụ ụzọ ndị ahụ, na oghereikuku niile dị warawara, na ebe njegharị gbara ha atọ gburugburu, ihe niile, elu ma ala, tinyere ọnụ ụzọ bụ nke eji osisi mmachite. Ala ya, na mgbidi ya ruo na oghereikuku, ma oghereikuku niile bụkwa ihe ekpuchiri ekpuchi.
EZE 41:17 Nʼelu oghere dị nʼebe ọnụ ụzọ ezi, nke gara nʼime ebe nsọ, nakwa nʼahụ aja niile, na nkebi na nkebi, gbaa gburugburu nʼime na nʼezi ebe nsọ ahụ,
EZE 41:18 ka a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ. Cherubim na-esota osisi nkwụ. Osisi nkwụ ọbụla na-esotakwa cherubim. Cherub ọbụla nwere ihu abụọ:
EZE 41:19 otu akụkụ cherub nke bụ ihu mmadụ chere ihu nʼotu nkwụ. Ihu ya nke ọzọ, nke bụ ihu ọdụm, chere ihu na nkwụ nke dị akụkụ nke ọzọ. A tụrụ ha gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ.
EZE 41:20 Site nʼala ụlọ ruo nʼelu ọnụ ụzọ ya, a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ nʼahụ aja ụlọ ezumezu ahụ.
EZE 41:21 Ọnụ ụlọ ezumezu ahụ nwere mbudo ibo nke akụkụ anọ ya ha otu nʼọtụtụ. Nke dị nʼihu Ebe ahụ Kachasị Nsọ, yiri ndị ọzọ.
EZE 41:22 Ebe ịchụ aja ya bụ nke eji osisi wuo. Akụkụ niile nke ebe ịchụ aja a ha nʼotu. Ọ dị otu mita na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita itoolu nʼakụkụ ya ọbụla. Osisi ka e ji wuo nkuku anọ ya, akụkụ ya niile, na ntọala ya. Mgbe ahụ, nwoke ahụ gwara m, “Nke a bụ tebul na-adị nʼihu Onyenwe anyị.”
EZE 41:23 Ma ụlọ ezumezu, ma Ebe ahụ Kachasị Nsọ, nwere ọnụ ụzọ abụọ, nʼotu nʼotu.
EZE 41:24 Ọnụ ụzọ ọbụla nwere ibo abụọ, ibo abụọ nke a na-akwagharị gburugburu.
EZE 41:25 A tụnyere onyinyo cherubim na osisi nkwụ nʼelu ibo na-edubanye nʼụlọ ezumezu ahụ, dịka ndị ahụ a tụrụ nʼahụ mgbidi niile. E jikwa osisi rụchie elu ihu mpụta nke ọnụ ụlọ ahụ.
EZE 41:26 Windo dị warawara dị nʼaja mpụta ọnụ ụlọ ahụ, nke e sekwasịrị oyiyi osisi nkwụ; ọnụụlọ nta niile nke ụlọnsọ ukwu ahụ nwekwara ihe a rụnyere nʼelu ụzọ ya, nke a machiri amachi.
EZE 42:1 Nwoke ahụ duuru m gaa nʼakụkụ ugwu, banye nʼime ogige ahụ dị nʼezi, kpọbata m nʼime ọnụụlọ ndị ahụ dị na ncherita ihu nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ.
EZE 42:2 Ụlọ ahụ nke ọnụ ụzọ ya chere ihu nʼebe ugwu dị iri mita ise na atọ nʼogologo, ebe obosara ya dị iri mita abụọ na asaa.
EZE 42:3 Ma nʼakụkụ nke dị iri mita na otu, site nʼime ogige nakwa nʼakụkụ nke dị na ncherita ihu pevumentị nke ogige dị nʼezi, ebe njegharị chere ebe njegharị ọzọ ihu, nʼokpukpu atọ ahụ.
EZE 42:4 Nʼihu ọnụụlọ ndị a, e nwere ka ụzọ njegharị nke dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo. Ọnụ ụzọ ha niile chere ihu nʼugwu.
EZE 42:5 Okpukpu ụlọ nke dị nʼelu asaghị mbara dịka nke dị nʼala, nʼihi na ebe njegharị ndị ahụ weere ọtụtụ oghere karịa ka ọ dị nʼọnụụlọ ndị dị okpukpu nke dị nʼala na nke etiti ụlọ ahụ.
EZE 42:6 Ebe a na-ejighị ogidi wuo ụlọ a, dịka e si wuo ndị dị nʼogige, nke a mere ka ụlọ ndị dị nʼelu na-akpa nkpa karịa ndị nke dị nʼala, na ndị dị nʼetiti.
EZE 42:7 E nwere mgbidi aja nke dị nʼezi nʼakụkụ ọnụụlọ niile, nʼụzọ ogige nke dị nʼezi. Ọ mapụtara nʼihu ọnụụlọ ndị ahụ, ogologo ihe dị iri mita abụọ na asaa.
EZE 42:8 Nʼọtụtụ ogologo ọnụụlọ ndị a, ndị dị nso nʼogige mpụta, ruru mita iri abụọ na itoolu, ebe ogologo ndị nke dịkarịsịrị nso ebe nsọ ahụ, ruru mita iri ise na asatọ.
EZE 42:9 Nʼokpuru ọnụụlọ ndị a, e nwere ụzọ mbata nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, dịka mmadụ na-abata ha site nʼogige dị na mpụta.
EZE 42:10 Nʼakụkụ ndịda, nʼogologo aja ụlọ dị nʼogige mpụta, nke dị nʼakụkụ ogige ụlọnsọ ukwu, nke chere aja ụlọ mpụta ihu, ọtụtụ ọnụụlọ dị ya.
EZE 42:11 Ụzọ njegharị dị nʼetiti akụkụ abụọ ụlọ ahụ, ha dịkwa ka ọnụụlọ ndị ahụ nke dị nʼụzọ ugwu. Ogologo ha na obosara ha bụ otu; ha niile yiri onwe ha. Ọnụ ụzọ ya dịkwa ka ọnụ ụzọ dị nʼugwu.
EZE 42:12 Otu a ka ọnụ ụzọ e si abanye nʼime ọnụụlọ ndị a dị na ndịda si dị. E nwere ọnụ ụzọ na mpụta, nke dị na mgbidi ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ. Ebe a ka e si abanye nʼime ọnụụlọ ndị ahụ.
EZE 42:13 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ime ọnụụlọ niile dị nʼugwu, na ime ọnụụlọ ndị dị na ndịda, bụ ndị a chere ogige ụlọnsọ ahụ ihu, bụ ime ụlọ dị nsọ, nke ndị nchụaja. Ebe ndị nchụaja ndị na-abịa nso Onyenwe anyị ịchụ aja ga-anọ rie nri niile nke kachasị nsọ, nʼebe ahụ ka ha ga-edebekwa aja ịnata ihuọma, aja mmehie na aja ikpe ọmụma, nʼihi na ụlọ ndị a dị nsọ.
EZE 42:14 Mgbe ndị nchụaja bara nʼime ebe nsọ ahụ nke e kewapụrụ iche, ha aghaghị esikwa nʼebe ahụ pụta nʼogige mpụta ezi, tupu ruo mgbe ha yisara uwe ha yii jee ozi, nʼihi na uwe ndị a dị nsọ. Ha ga-eyiri uwe ọzọ, tupu ha abanye nʼakụkụ ụlọ ndị ahụ dịịrị ndị ọzọ.”
EZE 42:15 Mgbe ọ tụchara ihe ndị dị nʼime ebe ụlọnsọ ahụ, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼọwụwa anyanwụ pụta, tụkwaa nʼakụkụ niile gburugburu.
EZE 42:16 O ji ihe ọtụtụ dị ogologo tụọ akụkụ ọwụwa anyanwụ, ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise.
EZE 42:17 O ji mkpirisi osisi ahụ e ji atụ ihe tụọ akụkụ nke ugwu ma chọpụta na ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise.
EZE 42:18 Ọ tụkwara akụkụ nke ndịda, chọpụtakwa na ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise.
EZE 42:19 Mgbe ahụ, ọ tụgharịrị jirikwa ihe ọtụtụ ahụ tụọkwa akụkụ nke ọdịda anyanwụ. Ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise.
EZE 42:20 Ya mere, ọ tụrụ akụkụ anọ niile nke ebe ahụ. Mgbidi gbara ya gburugburu. Ọtụtụ ha dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise, nʼogologo, obosara ya dịkwa ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise, iji kewapụta ebe dị nsọ site nʼebe ndị ọzọ.
EZE 43:1 Emesịa, ọ kpọbatakwara m nʼọnụ ụzọ mbata nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ.
EZE 43:2 Ma lee, ahụrụ m ebube Chineke nke Izrel ka o si nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-apụta. Olu ya dị ka mbigbọ nke ebili mmiri, ebube ya nwukwara nʼala ahụ niile.
EZE 43:3 Ọ dịkwa ka ọhụ mbụ m hụrụ, nke m buru ụzọ hụ nʼakụkụ ọnụ mmiri Keba, ya na nke m hụrụ na Jerusalem mgbe ọ bịara ibibi obodo ahụ. Adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.
EZE 43:4 Ebube Onyenwe anyị sitere nʼọnụ ụzọ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ bata nʼime ụlọnsọ ahụ.
EZE 43:5 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m bubata m nʼime ogige nke ime, ma ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ ukwu ahụ.
EZE 43:6 Mgbe ahụ, anụrụ m olu ka o si nʼụlọnsọ ahụ na-agwa m okwu, dịka nwoke ahụ na-eguzokwa nʼakụkụ m.
EZE 43:7 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ebe a bụ ebe nke ocheeze, na ebe nke ọbụ ụkwụ m abụọ ga-anọgide, ebe a ka m ga-ebi nʼetiti ụmụ Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Ụlọ Izrel agaghị emerụkwa aha nsọ m ọzọ, ha onwe ha maọbụ ndị eze ha, site nʼikpere arụsị niile ha na ibubata onyinye olili ozu ndị eze ha, mgbe ha nwụrụ anwụ.
EZE 43:8 Mgbe ha wuru mbata ọnụ ụzọ ha nʼakụkụ mbata ọnụ ụzọ m, tinye ọnụ ụzọ ha nʼakụkụ ọnụ ụzọ m, ọ bụkwa naanị mgbidi bụ ihe dị nʼetiti mụ na ha. Ha merụrụ aha nsọ m site nʼihe arụ niile ha mere. Ya mere m ji bibie ha nʼiwe m.
EZE 43:9 Ugbu a, ka ha wezuga adịghị ọcha na ife chi ndị ọzọ ha nʼihu m, bupụkwa onyinye olili ozu ndị eze ha nʼebe m nọ, mgbe ahụ, aga m ebi nʼetiti ha ruo mgbe ebighị ebi.
EZE 43:10 “Nwa nke mmadụ, kọwaara ụmụ Izrel ụlọnsọ ahụ m ziri gị. Gwa ha ụdịdị ya, na ịpụ iche ya, ka ihere mee ha nʼihi mmehie ha.
EZE 43:11 Ọ bụrụ nʼezie na ihere emee ha nʼihi ihe ha mere, mgbe ahụ, kọwaara ha ihe niile metụtara otu a ga-esi wuo ụlọnsọ a, na ihe gbasara nkwado ya, na ihe gbasara ọnụ ụzọ ọpụpụ na mbata ya niile, ihe metụtara ebumnobi nke owuwu ya niile na usoro na iwu niile banyere ya. Depụta ihe ndị a nʼihu ha, nye ha ka ha lezie anya mezuo ihe niile metụtara usoro a ga-agbaso wuo ya.
EZE 43:12 “Nke a bụ iwu ụlọ banyere nsọ ukwu ahụ. Ebe niile gbara elu ugwu a gburugburu ga-abụ ebe dịkarịsịrị nsọ! Nke a bụ iwu ụlọnsọ ahụ.
EZE 43:13 “Nke a bụ ọtụtụ niile gbasara ebe ịchụ aja ya: Ịdị elu nke ala ya bụ iri sentimita ise na atọ; ịgba gburugburu nke ọnụ ya bụ iri sentimita abụọ na atọ; obosara ya dị iri sentimita ise na atọ. Otu a ka ebe ịchụ aja ahụ ga-aha nʼogologo.
EZE 43:14 Site nʼụkwụ ya nke dị nʼala ruo nʼokere ya nke etiti, ọ ga-adị otu mita nʼogologo nakwa nʼuhie; site nʼokere nke nta ruo na nke ukwu ga-adị mita abụọ nʼogologo na ọkara nʼuhie.
EZE 43:15 Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita abụọ, mpi anọ sikwa nʼakụkụ ya gbagoo elu, nke ọbụla nʼime ha ga-adị ọkara mita nʼogologo.
EZE 43:16 Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita isii nʼogologo na mita isii nʼuhie, nwee akụkụ anọ nke ha nʼotu.
EZE 43:17 Nke dị nʼokpuru ga-adị mita asatọ nʼakụkụ ọbụla; a ga-arụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu, ka ịdị elu nke ọnụ ọnụ ya bụrụ iri sentimita abụọ na asaa. Akụkụ ya niile gbasapụrụ site nʼelu ya ruo nʼala. Ọtụtụ mgbasapụ a dị iri sentimita ise na atọ. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ka ihe e ji arịgo ya dị.”
EZE 43:18 Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị a bụ usoro metụtara iwu ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ifesa ọbara nʼelu ebe ịchụ aja mgbe e wusiri ya.
EZE 43:19 Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị Livayị si nʼezinaụlọ Zadọk, bụ ndị na-abịa m nso ife ofufe nʼihu m, otu oke ehi maka aja mmehie, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 43:20 Unu ga-ewere ụfọdụ nʼọbara ya tee na mpi anọ nke ebe ịchụ aja, na nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja, na nʼakụkụ anọ nke mbadamba nkume dị nʼelu, na gburugburu ọnụ ọnụ ya, si otu a sachaa ebe ịchụ aja ahụ, kpuchikwaara ya mmehie.
EZE 43:21 Mgbe ahụ, a ga-ewere nwa oke ehi e ji chụọ aja mmehie ahụ, kpọọ ya ọkụ nʼebe a kwadoro nʼezi ụlọnsọ ukwu ahụ.
EZE 43:22 “Nʼụbọchị nke abụọ, ị ga-eji nwa mkpi na-enweghị ntụpọ chụọ aja mmehie. A ga-eme ka ebe ịchụ aja dị ọcha, dịka e ji oke ehi ahụ mee ka ọ dị ọcha.
EZE 43:23 Mgbe i mechara mmemme nsacha ndị a, werekwa nwa oke ehi ọzọ nke na-enweghị ntụpọ, na nwa ebule site nʼigwe anụ nke na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
EZE 43:24 Were ha jee chee nʼihu Onyenwe anyị, ka ndị nchụaja were nnu fesa ha dịka aja nsure ọkụ a chụrụ nye Onyenwe anyị.
EZE 43:25 “Ụbọchị asaa, kwa ụbọchị ka ị ga-ewepụta otu mkpi, na nwa oke ehi, na nwa ebule site nʼigwe anụ ndị ahụ, chụọ aja mmehie. Ha niile ga-abụ ụmụ anụmanụ ndị na-enweghị ntụpọ.
EZE 43:26 Ụbọchị asaa ka ha ga na-achụ aja ikpuchi mmehie nʼihi ebe ịchụ aja, mee ka ọ dị ọcha, site otu a doo ya nsọ.
EZE 43:27 Ụbọchị nke asatọ, na nʼụbọchị ọbụla so ya, ndị nchụaja ga-achụ aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja, chụọkwa aja udo. Mgbe ahụ, aga m anabatakwa unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
EZE 44:1 Mgbe ahụ, o mere ka m laghachi nʼụzọ, nʼọnụ ụzọ ama nke ebe nsọ ahụ, nke dị nʼezi, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ, ma a gbachiri ya agbachi.
EZE 44:2 Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Ọnụ ụzọ ama nke a ga-abụ ihe e mechiri emechi. A gaghị emeghe ya ọzọ, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi na ya bata. Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel esitela na ya bata. Ya mere, ọ bụ ihe emechiri emechi.
EZE 44:3 Naanị nwa eze, naanị ya onwe ya, bụ onye ga-anọdụ ala nʼime ya, iri nri nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ bata, ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ ga-esi pụọ.”
EZE 44:4 Mgbe ahụ, o mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ. Elere m anya hụ na ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼihi ya, adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.
EZE 44:5 Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, leruo anya nke ọma, gee ntị nke ọma nʼihe niile m na-agwa gị banyere iwu m niile na usoro niile nke ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Leruo anya nke ọma banyere ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọnsọ ukwu a, na nke ọpụpụ niile nke ebe nsọ a.
EZE 44:6 Ị ga-agwa ndị Izrel bụ ndị ụlọ nnupu isi, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, o zuola bụ ibi ndụ arụ unu niile ahụ, unu ndị Izrel!
EZE 44:7 Nʼihi na ọ bụghị naanị na ihe arụ unu mere dị ukwu, kama unu mekwara ihe arụ kachasị site nʼịkpọbata ndị ala ọzọ a na-ebighị anụ ahụ ha na obi ha ugwu nʼime ụlọnsọ, si otu a merụọ ụlọnsọ mgbe unu na-ewetara m nri nsọ, nke bụ abụba na ọbara. Nʼụzọ dị otu a, unu emebiela ọgbụgba ndụ m.
EZE 44:8 Unu edebeghị iwu m nyere unu banyere ihe m ndị dị nsọ, kama unu goro ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-elekọta ebe nsọ m.
EZE 44:9 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, o nweghị onye ala ọzọ ọbụla a na-ebighị anụ ahụ ya na obi ya ugwu kwesiri ịbata nʼụlọnsọ m. Ọ bụladị ndị ọbịa ndị bi nʼetiti ụmụ Izrel.
EZE 44:10 “ ‘Ndị ikom agbụrụ Livayị niile, ndị sitere nʼijere m ozi wezuga onwe ha mgbe Izrel bidoro ịgbaso arụsị niile ha, ga-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
EZE 44:11 Ha ga-abụ ndị na-eje ozi nʼime ebe nsọ m, ndị nlekọta nke ọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwuu, na-ejekwa ozi nʼime ya; ha ga-egburu ndị m anụ e wetara maka ịchụ aja nsure ọkụ na nke aja ndị ọzọ, ha ga-eguzokwa nʼihu ha jeere ha ozi.
EZE 44:12 Ma nʼihi na ha guzoro nʼihu arụsị jeere ha ozi, mee ka ụlọ Izrel daba na mmehie ikpere arụsị, nʼihi nke a, eweliela m aka elu na-aṅụ iyi na ha aghaghị ịta ahụhụ mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 44:13 Ha agaghị abịakwute m nso ije ozi dịka ndị nchụaja, maọbụ bịaruo nso ihe nsọ m niile ọbụla maọbụ onyinye m dị nsọ karịchasịa onyinye nsọ niile, ha aghaghị ibu ọnọdụ ihere nke ihe arụ niile ha mere.
EZE 44:14 Ma aga m ahọpụta ha ka ha bụrụ ndị ilekọta ụlọnsọ m dị nʼaka, nʼihi ịrụ ọrụ niile na ije ozi niile dị nʼime ya.
EZE 44:15 “ ‘Ma ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk, ndị Livayị, ndị chegidere ebe nsọ m nche, mgbe Izrel niile sitere nʼebe m nọ kpafuo, ga-abịa nso ijere m ozi, ha ga-eguzo nʼihu m chụọ aja abụba na ọbara. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 44:16 Ọ bụ naanị ha ga-abanye nʼime ebe nsọ m, naanị ha ga-abịakwa na tebul m ije ozi nʼihu m, na ife m dịka ndị nche.
EZE 44:17 “ ‘Mgbe ha na-abata nʼọnụ ụzọ ama nke ogige dị nʼime, ha ga-eyi naanị akwa ọcha. Ha agaghị eyi uwe ọbụla e ji ajị anụ kpaa mgbe ha na-eje ozi nʼogige ime nke ụlọnsọ ukwu m.
EZE 44:18 Ha ga-eji akwa ọcha kee nʼisi ha, yirikwa uwe ọcha nʼukwu ha. Ha agaghị eyi ihe ọbụla ga-eme ka ọsịsọọ gbaa ha.
EZE 44:19 Mgbe ha na-apụ nʼogige dị nʼezi ebe ndị mmadụ nọ, ha ga-eyipụ uwe ha yi mgbe ha na-eje ozi, hapụkwa ha nʼime ọnụụlọ nsọ ndị a, yiri uwe ọzọ, ka ha ghara ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị e doro nsọ site nʼimetụ uwe ha ahụ.
EZE 44:20 “ ‘Ha agaghị ekwe ka agịrị isi ha too ogologo, ha agakwaghị akpụchapụ ya. Naanị mkpacha ka ha ga na-akpacha isi ha.
EZE 44:21 Onye nchụaja ọbụla agaghị aṅụ mmanya vaịnị mgbe ọ na-abata nʼogige dị nʼime.
EZE 44:22 Ha agaghị alụ nwanyị nke di ya nwụrụ anwụ, maọbụ nwanyị gbaara di ya alụkwaghị m. Kama ọ bụ naanị ụmụ agbọghọ ndị sitere nʼagbụrụ Izrel ndị na-amaghị nwoke, maọbụ nwunye ndị nchụaja nwụrụ anwụ.
EZE 44:23 Ha ga-akụziri ndị m ihe dị iche nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ; gosi ha otu esi amata ihe dị iche nʼetiti ihe na-adịghị ọcha na nke dị ọcha.
EZE 44:24 “ ‘Ha ga-abụ ndị ikpe, idozi esemokwu dapụtara nʼetiti ndị m. Usoro iwu m niile ka ha ga-eji kpee ikpe. Ndị nchụaja nʼonwe ha kwa ga-erube isi nʼiwu m niile nʼoge mmemme ọbụla dị nsọ. Ha ga-ahụkwa na e doro ụbọchị izuike nsọ.
EZE 44:25 “ ‘Onye nchụaja agaghị emerụ onwe ya site nʼije nʼebe ozu dị, karịakwa maọbụ ozu nna ya maọbụ nne ya, ma o bụ nwa ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị na-enweghị di.
EZE 44:26 Mgbe e mechara ka ọ dị ọcha ọzọ, ọ ga-echere ruo ụbọchị asaa.
EZE 44:27 Ma nʼụbọchị ahụ, ọ ga-alọghachi nʼụlọ ukwu ahụ ịbanye nʼime ebe nsọ, ọ ga-ebu ụzọ chụọ aja mmehie nʼihi onwe ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 44:28 “ ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m bụ ihe nketa nke ndị nchụaja ga-enweta. Unu agaghị enye ha ihe nweta ọbụla nʼIzrel. Mụ onwe m bụ ihe nketa ha.
EZE 44:29 Ha ga-eri onyinye ịnata ihuọma, ihe aja mmehie, ihe aja ikpe ọmụma, ihe niile dị nʼIzrel e doro nsọ nye Onyenwe anyị ga-abụ nke ha.
EZE 44:30 Mkpụrụ mbụ kachasị mma site na mkpụrụ ubi ọbụla na onyinye niile pụrụ iche ga-abụ nke ndị nchụaja. Ọka mbụ a kwọrọ akwọ, nke a na-eweta nʼihe ubi ga-abụkwa nke ndị nchụaja, ime ka ngọzị dịkwasị nʼụlọ unu.
EZE 44:31 Ndị nchụaja agaghị ata nnụnụ ọbụla, maọbụ anụ nke nwụrụ ọnwụ chi ya, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu.
EZE 45:1 “ ‘Mgbe unu ga-eke ala ahụ dịka ihe nketa, unu ga-ebu ụzọ nye Onyenwe anyị otu oke nʼime ya ka ọ bụrụ oke dị nsọ nke ala ahụ. Ogologo ya ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita iri na otu. Ihe dị nsọ ka ala ahụ niile ga-abụ gbaa gburugburu.
EZE 45:2 Site nʼala, otu akụkụ dị narị mita abụọ na iri itoolu na otu, na iri sentimita asaa na ise, ga-abụ maka ebe nsọ. A ga-ahapụ ala dị iri mita abụọ na itoolu gburugburu ya.
EZE 45:3 Site nʼoke ebe ahụ dị nsọ, tụpụta oke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, obosara ya kilomita ise na ọkara. Ọ bụ nʼime ya ka ebe nsọ, ya bụ Ebe ahụ Kachasị Nsọ ga-adị.
EZE 45:4 Ọ ga-abụ oke ala ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼebe nsọ, na ndị na-abịa nso ije ozi nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-abụkwa ebe ụlọ obibi ha ga-adị, bụrụkwa ebe dị nsọ maka ebe nsọ ahụ.
EZE 45:5 Ala ọzọ dị ya nʼakụkụ, nke ga-adị kilomita iri na atọ nʼogologo, kilomita ise na ọkara nʼobosara ya, ga-abụ ebe obibi ndị Livayị, ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwuu ahụ.
EZE 45:6 “ ‘Nʼakụkụ obodo nsọ ka a ga-ekewapụta ala nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dịkwa kilomita abụọ na ọkara, nke a ga-abụ nke ndị Izrel.
EZE 45:7 “ ‘A ga-ewepụta ala pụrụ iche maka nwa eze. Ala a ga-adị nʼakụkụ abụọ nke ala nsọ ahụ, na obodo ahụ. Ala a ga-agbatịrị site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ebe oke ya dị ruo nʼosimiri Mediterenịa. Ọ ga-esitekwa nʼoke ala ya nʼọwụwa anyanwụ gbatịrị ruo nʼebe ebo Izrel nwere ala ha. Nʼụzọ dị otu a, ala a ga-aha ka ala ebo Izrel ketara.
EZE 45:8 Ala a ga-abụrụ ya ihe nketa nʼIzrel. Ndịisi m agaghị emegbu ndị m ọzọ, ma ha ga-ahapụ ndị Izrel ka ha keta ala ndị a dịka ebo niile ha si dị.
EZE 45:9 “ ‘Nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: O zuolara unu, unu ụmụ ndị eze Izrel. Kwụsịnụ ịpụnara ndị m ihe ha nwere nʼike, kpeenụ ikpe ziri ezi na-emekwa ihe kwesiri ekwesi. Kwụsịnụ ịchụpụ ndị m site nʼihe ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
EZE 45:10 Ka ihe ọtụtụ unu ji ere ahịa unu bụrụ ezigbo efa na ezigbo baf nke a na-ejighị aghụghọ kpụọ.
EZE 45:11 Ka ihe ọtụtụ homa bụrụ ihe unu ga-eji na-atụ ihe niile, ma mmanụ, ma ọka. Ihe ọtụtụ ndị ọzọ unu ga-enwe ga-abụ efa, nke bụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka ọka. Nke ọzọ bụ baf, nke bụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka mmanụ.
EZE 45:12 Ihe ọtụtụ a ga-eji mata ịdị arọ nke ihe ọbụla ga-abụ shekel. Ihe a ga-eji gbanwere shekel a bụ iri gera abụọ naanị. Iri shekel isii ka a ga-ejikwa gbanwere otu mina.
EZE 45:13 “ ‘Nke a bụ onyinye pụrụ iche unu ga-enye: otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa, site nʼotu homa nke ọka wiiti unu. Unu ga-enyekwa otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa site nʼotu homa ọka balị unu.
EZE 45:14 Dịka e nyere ya nʼiwu, unu ga-eji ihe ọtụtụ baf, weta mmanụ oliv bụ otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼotu kọ ọbụla (kọ na-erita baf iri, nʼihi na baf iri, bụ ọtụtụ otu homa).
EZE 45:15 Ọzọkwa, otu atụrụ nke sitere nʼigwe atụrụ dị narị atụrụ abụọ, nke si nʼebe ịta nri nke Izrel a gbara mmiri nke ọma ka unu ga-eweta. A ga-eji ndị a chụọ aja mkpụrụ ọka, na aja nsure ọkụ, na aja udo, maka ikpuchiri ndị wetara ha mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
EZE 45:16 Ndị niile nke nʼala ahụ ga-eso nwa eze Izrel bute onyinye ndị a.
EZE 45:17 Nwa eze ahụ ka ọ dịrị iweta ihe eji achụ aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka, aja ihe ọṅụṅụ niile, na nke Ọnwa ọhụrụ nakwa nke ụbọchị izuike niile, nʼoge mmemme niile nke ndị Izrel. Ọ ga-ewetakwa ihe eji achụ aja mmehie, aja mkpụrụ ọka, aja nsure ọkụ, aja udo maka ikpuchiri ụmụ Izrel mmehie ha.
EZE 45:18 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ ọbụla, unu ga-ewere nwa oke ehi nke na-enweghị ntụpọ, chụọ aja ido ụlọnsọ m nsọ.
EZE 45:19 Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara nke aja mmehie ahụ tee ya nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ m, na nʼakụkụ anọ nke ọnụ ebe ịchụ aja, na nʼahụ ibo nke ọnụ ụzọ ogige ime.
EZE 45:20 Unu ga-emekwa otu ihe ahụ nʼabalị asaa nke ọnwa ahụ nʼihi onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maka ikpuchi mmehie metụtara ụlọnsọ m.
EZE 45:21 “ ‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka unu ga-edebe Mmemme Ngabiga. Ọ ga-abụ mmemme abalị asaa. Nʼụbọchị ndị a, naanị achịcha nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ka unu ga-eri.
EZE 45:22 Nʼụbọchị ahụ, onyeisi ga-eweta otu nwa oke ehi maka aja mmehie nke onwe ya, na maka mmehie mmadụ niile nke ala ahụ.
EZE 45:23 Nʼụbọchị asaa nke mmemme ahụ, kwa ụbọchị, ọ ga-eweta oke ehi asaa na ebule asaa, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, dịka ihe ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. Ọ ga-enyekwa nwa mkpi kwa ụbọchị maka aja mmehie.
EZE 45:24 Ọ ga-ewetakwa nʼihi onyinye ịnata ihuọma, narị lita ọka anọ na iri itoolu, nke bụ otu ọtụtụ otu oke ehi, otu ọtụtụ otu ebule. Tinyere lita mmanụ oliv atọ na ụma asatọ. Lita mmanụ atọ na ụma asatọ dịkwara otu efaf ọka.
EZE 45:25 “ ‘Nʼoge mmemme ụbọchị asaa ahụ, nke ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, ọ ga-ewetakwa ihe a ga-eji chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na mmanụ.
EZE 46:1 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ọnụ ụzọ ama nke ogige ime, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ ga-abụ ihe e mechiri emechi nʼụbọchị isii niile unu na-arụ ọrụ. Ma a ga-emeghe ya nʼụbọchị izuike, na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ.
EZE 46:2 Nwa eze ga-esitekwa na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama bata, guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ndị nchụaja ga-edozikwa aja nsure ọkụ ya, na aja udo ya. Ọ ga-anọkwa nʼụlọ mbata kpọọ isiala nke ofufe ya, sitekwa nʼebe ahụ pụọ. Ma a gaghị emechi ọnụ ụzọ ahụ tutu ruo anyasị.
EZE 46:3 Nʼihu ọnụ ụzọ ama ka ndị ala a ga-anọ fee Onyenwe anyị ofufe nʼụbọchị izuike na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ.
EZE 46:4 Ihe nwa eze ahụ ga-eji chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ nʼụbọchị izuike na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ ga-abụ ụmụ ebule isii, na otu ebule, ndị na-enweghị ntụpọ.
EZE 46:5 Ọ ga-eweta ihe e ji achụ aja mkpụrụ ọka, nke bụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu ebule. Ọ ga-ewetakwa lita mmanụ oliv asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ahụ, tinyere onyinye ụmụ atụrụ dịka o si masị ya.
EZE 46:6 Nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ, ọ ga-eweta otu nwa oke ehi, ụmụ atụrụ isii na otu ebule, ha niile ọ dịghị nke ga-enwe ntụpọ ọbụla.
EZE 46:7 Ọ ga-ewetakwa otu oke ehi na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ, maka aja mkpụrụ ọka. Ọ ga-enye ebule ahụ na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ. Ọ ga-enyekwa ụmụ atụrụ ndị ahụ na ụtụ ọka dịka o si masị ya inye ha, tinyere iri lita ọka abụọ na abụọ, nke ọ ga-eweta maka lita mmanụ oliv asaa.
EZE 46:8 Mgbe nwa eze ga-abata nʼụlọ ahụ, ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ebe ahụ kwa ka ọ ga-esikwa pụọ.
EZE 46:9 “ ‘Ma mgbe ndị ala ahụ ga-abata nʼihu Onyenwe anyị nʼoge mmemme dị nsọ, onye ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu bata aghaghị ịpụ site nʼọnụ ụzọ nke dị na ndịda. Ndị si na ndịda bata ga-esitekwa nʼụzọ nke ugwu pụọ. Ọ dịghị onye ga-esi nʼụzọ o si bata laghachi, kama ha ga-esi ụzọ nke chere ebe ha si bata ihu pụọ.
EZE 46:10 Nwa eze ga-anọ nʼetiti ha, ọ bụrụ na ha abanye, ọ ga-eso ha banye, ọ bụrụkwa na ha apụwa, ọ ga-esokwa ha pụọ.
EZE 46:11 Nʼoge mmemme ndị ahụ pụrụ iche, na mmemme ndị akara aka, ihe a ga-eji nye onyinye mkpụrụ ọka ga-abụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu oke ehi, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ na otu ebule, tinyere ụmụ atụrụ nke ọnụọgụgụ ya ga-abụ dịka o si masị ya, tinyere lita mmanụ asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ọbụla.
EZE 46:12 “ ‘Mgbe ọbụla onyeisi chọrọ inye onyinye afọ ofufu, maka ịchụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ maọbụ aja udo, a ga-emeghere ya ọnụ ụzọ ime nke dị nʼọwụwa anyanwụ ka o si nʼebe ahụ bata. Ọ ga-enye onyinye ya dịka e si enye ya nʼụbọchị izuike. Emesịa, ọ ga-atụgharịa pụọ. A ga-emechikwa ụzọ ahụ mgbe ọ pụchara.
EZE 46:13 “ ‘Ọ bụ nwa atụrụ gbara otu afọ nke na-enweghị ntụpọ ka ị ga-eweta ụbọchị niile maka ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ọ bụ kwa ụtụtụ, kwa ụtụtụ ka ị ga-eweta ya.
EZE 46:14 Ị ga-ewetakwa onyinye mkpụrụ ọka kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ tinyere ya, ihe niile ga-emejupụta ya bụ lita ụtụ ọka isii, na lita mmanụ abụọ e ji agwakọta ya. Iche onyinye mkpụrụ ọka a nʼihu Onyenwe anyị bụ ụkpụrụ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
EZE 46:15 Ya mere, ha ga-edozi nwa atụrụ na ụtụ ọka na mmanụ oliv ahụ, kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ, maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa mgbe niile.
EZE 46:16 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ọ bụrụ na onyeisi enye onye ọbụla nʼime ụmụ ya ndị ikom onyinye site nʼihe nketa ya, ihe ahụ ga-abụ nke ya, bụrụkwa nke mkpụrụ ya, ọ ga-abụ oke ha site nʼihe nketa ruo ebighị ebi.
EZE 46:17 Ọ bụrụkwanụ na o kenye otu nʼime ndị ohu ya ala site nʼihe nketa ya, ala ahụ ga-abụ nke ohu ahụ tutu ruo nʼafọ inwere onwe, nke bụ afọ asaa ọbụla. Mgbe ahụ, ohu ahụ ga-enwere onwe ya, ma ala ahụ ga-aghọkwa nke nwa eze ahụ. Ihe nketa ya bụ nke dịịrị naanị ụmụ ya, nke ha ka ọ bụ.
EZE 46:18 Nwa eze ahụ agaghị ewere ala ọbụla site nʼihe nketa ndị mmadụ nʼaka ike, si otu a chụpụ ha site nʼala ha. Ala ọbụla ọ na-enye ụmụ ya ga-abụrịrị ihe nketa sitere nʼala nke aka ya. Ka a ghara ime ka ọ bụladị otu nʼime ndị m bụrụ onye e kewapụrụ site nʼihe nketa ha.’ ”
EZE 46:19 Mgbe nke a gasịrị, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama kpọbata m nʼọnụụlọ ndị ahụ dị nsọ, nke chere ihu nʼugwu, nke bụ ihe nketa ndị nchụaja. O gosiri m otu ebe dị na nsọtụ akụkụ ọdịda anyanwụ.
EZE 46:20 Ọ sịrị m, “Ebe a ka ndị nchụaja ga-anọ sie anụ aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Ebe a ka ha ga-anọkwa ghee onyinye mkpụrụ ọka, ka a ghara iwebata ha na mpụta ogige a nakwa ido ndị mmadụ nsọ.”
EZE 46:21 Mgbe ahụ, o mere ka m pụta ọzọ nʼogige ezi. O duuru m gaa nʼakụkụ anọ nke ogige ahụ. Ahụrụ m na e nwere ogige nke dị nʼakụkụ ọbụla.
EZE 46:22 Nʼakụkụ anọ nke ogige ndị a, ogige ndị ọzọ dị nʼime ha. Ha ruru mita iri abụọ na atọ nʼogologo, ebe obosara ha rukwara mita iri na asaa nʼọkara. Ogige anọ ndị a ha nʼotu.
EZE 46:23 Nʼime ụlọ ahụ, gburugburu ya, e nwere ahịrị e ji nkume doo, nke nwere ekwu dị nʼokpuru ahịrị nkume ahụ.
EZE 46:24 Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ụlọ ebe ndị niile na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu ahụ ga-anọ na-esi ihe aja niile ndị mmadụ webatara.”
EZE 47:1 Mgbe ahụ, nwoke ahụ mere ka m lọghachikwa nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ. Ahụrụ m iyi nke na-asọ na-aga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ (nʼihi na ihu ụlọnsọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ). Mmiri ahụ si nʼokpuru ụlọnsọ ukwu ahụ nʼakụkụ aka nri nke ebe ịchụ aja, nʼakụkụ ndịda ya na-asọpụta,
EZE 47:2 O mere ka m si nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu pụta, ma gaa nʼọnụ ụzọ nke ọwụwa anyanwụ, ebe m hụrụ mmiri ahụ ka o si na ndịda na-asọpụta.
EZE 47:3 Mgbe anyị na-aga, o ji ihe ọtụtụ dị ya nʼaka tụpụta ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ. O duuru m na-agafe mmiri ahụ. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela na nkwonkwo ụkwụ.
EZE 47:4 O jikwa ihe ọtụtụ ya tụpụtakwa ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, durukwa m na-aga. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela m nʼikpere. Mgbe ọ tụpụtara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, o duuru m gafee mmiri ruru m nʼukwu.
EZE 47:5 Ọ tụpụtakwara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, mmiri ahụ ghọrọ osimiri nke m na-apụghị ịgafe, nʼihi na mmiri ahụ toro eto bụrụ mmiri ogwugwu, osimiri nke mmadụ na-apụghị iji ije ụkwụ gafee.
EZE 47:6 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụrụ ihe ndị a?” O duuru m laghachi nʼọnụ mmiri.
EZE 47:7 Mgbe m rutere nʼọnụ mmiri, lee, ahụrụ m ọtụtụ osisi nke toro nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ.
EZE 47:8 Ọ sịrị, “Iyi a na-asọ na-aga akụkụ ọwụwa anyanwụ, sọbanye nʼime Araba, tutu bịa sọbanye nʼosimiri nnu ahụ. Mgbe ọ sọbanyere nʼosimiri nnu ahụ, mmiri ya na-aghọ mmiri dị mma ọṅụṅụ
EZE 47:9 Ọtụtụ ihe e kere eke dị ndụ ga-ebi nʼebe ọbụla mmiri a na-asọ aga. Azụ dị ukwuu ga-ejupụta nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri a na-asọbanye nʼebe ahụ, na-eme ka mmiri osimiri ghọọ mmiri dị mma ịṅụ aṅụ. Ya mere, ihe niile dị nʼebe ọbụla mmiri a sọjere ga-adị ndụ.
EZE 47:10 Ndị ọkụ azụ ga-eguzo nʼọnụ mmiri, site nʼEn-Gedi ruo nʼEn-Eglaim a gaghị enweta ebe a na-agbasa ụgbụ e ji egbu azụ. Azụ dị iche iche ga-adịkwa, dịka azụ osimiri Mediterenịa.
EZE 47:11 Ma ebe apịtị ya niile, nʼebe niile mmiri na-adọ, agaghị adị ọhụrụ, ọ bụ nnu ga-aga ka a ga-ahapụrụ ebe ndị ahụ.
EZE 47:12 Mkpụrụ osisi dị iche iche ga-eto nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, mkpụrụ ga-adị nʼelu ha mgbe niile. Mkpụrụ ọhụrụ ga-adị nʼọnwa ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmiri si nʼebe nsọ ahụ na-agba ha mmiri. Mkpụrụ ha ga-abụ nri, akwụkwọ ha ga-abụkwa maka ịgwọ ọrịa.”
EZE 47:13 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Nke a ga-abụ oke ala nke unu ga-eke nʼetiti ebo iri na abụọ nke Izrel dịka ihe nketa ha, Josef ga-enweta oke ala abụọ.
EZE 47:14 Ebo ọbụla ga-eketa dịka ibe ya ketara, nʼihi na-eweliri m aka ṅụọ iyi na m ga-enye ndị nna nna unu ala ahụ, na ala a ga-aghọkwa ihe nketa unu.
EZE 47:15 “Nke a ga-abụkwa oke ala nke ala unu ahụ. “Nʼakụkụ ugwu, ọ ga-esite nʼosimiri Mediterenịa nʼakụkụ ụzọ Hetlon, gafee Lebo gawa Zedad,
EZE 47:16 site ya ruo Berota na Sibraim (nke dị nʼoke ala dị nʼagbata Damaskọs na Hamat), rukwaa na Haza Hatikon, nke dị nʼoke ala Hauran.
EZE 47:17 Oke ala ahụ ga-esite nʼoke osimiri gbasoro oke ala nke ugwu Damaskọs ruo Haza Enan. Oke ala ndị Hamat ga-adịkwa nʼakụkụ ugwu. Nke a ga-abụ oke ala nke akụkụ ugwu unu.
EZE 47:18 Oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-esite nʼagbata Hauran na Damaskọs soro akụkụ osimiri Jọdan, nʼagbata ndị Gilead na ala ndị Izrel ruo nʼosimiri dị nʼọwụwa anyanwụ, ruokwa Tama. Nke a ga-abụkwa oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
EZE 47:19 Oke ala na ndịda, ọ ga-esite na Tama ruo ọbụladị mmiri Meriba Kadesh, soro ụzọ ọdọ mmiri iyi Ijipt ruo osimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala ahụ na ndịda.
EZE 47:20 Nʼọdịda anyanwụ, osimiri Mediterenịa ga-abụ oke ala, ruo na ncherita ihu ụzọ e si abata Hamat. Nke a bụ oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
EZE 47:21 “Ala niile dị nʼime oke ala ndị a, ka unu ga-eke nʼetiti onwe unu dịka ebo Izrel si dị.
EZE 47:22 Keenụ ha ka ha bụrụ ihe nketa nye onwe unu, ma nyekwa ndị ọbịa bi nʼetiti unu, bụ ndị ọbịa niile mụtara ụmụ. Unu ga-agụ ha dịka ndị amụrụ nʼala Izrel. Ha ga-esokwa unu keta oke nʼihe nketa a na-ekenye ndị ebo niile nke Izrel.
EZE 47:23 A ga-ekenye ndị ọbịa ihe nketa nʼebo ọbụla ha bi nʼetiti ha.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
EZE 48:1 “Nke a bụ aha ebo niile, na ala ha ga-eketa: “Dan otu oke. Site na nsọtụ ugwu, nʼakụkụ ụzọ Hetlon ruo mbata Hamat. Haza Enan na oke ala ugwu Damaskọs, nke dị nʼakụkụ Hamat ga-abụ akụkụ oke ala ha site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
EZE 48:2 Asha ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Dan, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
EZE 48:3 Naftalị ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Asha, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
EZE 48:4 Manase nwere otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Naftalị, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
EZE 48:5 Ifrem ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Manase, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
EZE 48:6 Ruben ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ifrem, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
EZE 48:7 Juda ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ruben, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
EZE 48:8 “Ala nke ya na oke ala ndị Juda ga-agbatị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ka ị ga-enye dịka onyinye pụrụ iche. Obosara ya ga-abụ ihe dị kilomita iri na atọ. Ogologo ya site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ ga-aha ka ala otu ebo ketara. Ụlọnsọ ukwu ahụ ga-adịkwa nʼetiti ya.
EZE 48:9 “Ogologo ebe a ewepụtara iche nye Onyenwe anyị ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita ise na ọkara.
EZE 48:10 Nke a ga-abụ ala dị nsọ e debere iche nye ndị nchụaja. Nʼakụkụ ugwu, ịdị ogologo ala ahụ ga-abụ kilomita iri na atọ. Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ogologo ya bụ kilomita ise na ọkara. Ogologo nke akụkụ ndịda na nke ugwu bụ otu. Otu a kwa, ogologo nke akụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ bụ otu. Ebe nsọ Onyenwe anyị ga-adị nʼetiti ya.
EZE 48:11 Ọ ga-adịrị ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk ndị e doro nsọ, ndị sitere nʼikwesị ntụkwasị obi jeere m ozi, ndị na-esiteghị nʼiso ụzọ m kpafuo dịka ndị Izrel na agbụrụ Livayị mere mgbe ha mehiere.
EZE 48:12 Ọ bụ onyinye pụrụ iche a na-enye ha site nʼala ahụ dị nsọ, bụ ala ahụ kachasị nsọ, nke ya na ala ndị Livayị nwekọrọ oke ala.
EZE 48:13 “Nʼakụkụ ala ndị nchụaja, a ga-ekenye ndị Livayị ala nke ha. Ha ga-eketa ala nke ogologo ya bụ kilomita iri na atọ, nke obosara ya bụ kilomita ise na ọkara.
EZE 48:14 O nweghị akụkụ ala nsọ a a ga-ere ere, maọbụ nye ya ndị ọzọ, nʼihi na ihe dị nsọ ka ọ bụ nye Onyenwe anyị.
EZE 48:15 “Ala nke fọdụrụ, nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dị kilomita ise na ọkara ga-abụ ala ọha. A ga-ewu ebe obibi nʼelu ya, wukwaa ebe ịzụ anụ ụlọ. Obodo ga-adị nʼetiti ya,
EZE 48:16 nke ogologo akụkụ ugwu ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ndịda ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ọwụwa anyanwụ ruru kilomita abụọ na ụma anọ, na akụkụ ọdịda anyanwụ rukwara kilomita abụọ na ụma.
EZE 48:17 Ogologo nke ala ebe ịta nri nke ga-agba obodo ahụ gburugburu ga-aha nʼotu. Ọ ga-adị narị mita na iri mita atọ na ise nʼugwu, na ndịda narị mita na iri mita atọ na ise, nʼọwụwa anyanwụ narị mita na iri mita atọ na ise, nʼakụkụ nʼọdịda anyanwụ narị mita na iri mita atọ na ise.
EZE 48:18 Ma nke ga-afọdụ na ya, nʼakụkụ oke ala ahụ dị nsọ nke gara ogologo ya niile, ga-abụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ kilomita ise na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụkwa kilomita ise na ọkara. Ihe omume ya ga-abụ nri nye ndị ọrụ nke obodo ahụ.
EZE 48:19 Ndị ọrụ si nʼobodo, bụ ndị na-akọ ya ga-abụkwa ndị sị nʼebo niile nke Izrel.
EZE 48:20 Ala ahụ niile, ma ala ahụ e doro nsọ, ma ala ndị obodo, ga-adị kilomita iri na atọ nʼakụkụ ya ọbụla.
EZE 48:21 “Ala niile fọdụrụ nʼakụkụ abụọ nke ala ahụ dị nsọ, na ala ndị obodo ga-abụ nke nwa eze. Ọ ga-agbatị ruo ọwụwa anyanwụ site nʼọtụtụ kilomita iri na atọ nke oke ahụ dọ nsọ ruo nʼoke ala ọwụwa anyanwụ, sitekwa na kilomita iri na atọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo oke ala ọdịda anyanwụ. Akụkụ abụọ ndị a nke gbatịrị ruo nʼoke ala ndị obodo ga-abụ nke onye ọchịchị, ebe nsọ ahụ na ụlọ ukwu ahụ ga-adị nʼetiti ha.
EZE 48:22 Ya mere, oke ala nke ndị Livayị na ala ndị obodo ga-adị nʼetiti ala nke nwa eze nwee. Oke ala nke nwa eze ahụ ga-adị nʼetiti oke ala Juda na oke ala Benjamin.
EZE 48:23 “Ala e nyere ebo fọdụrụ dị otu a: “Benjamin ga-enwe otu oke, nke sitere nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
EZE 48:24 Simiọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Benjamin ga-enwekọ otu oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
EZE 48:25 Isaka ga-enwe otu oke; ha na ndị Simiọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
EZE 48:26 Zebụlọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Isaka ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
EZE 48:27 Gad ga-enwe otu oke; ha na ndị Zebụlọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
EZE 48:28 Ma oke ala Gad nke chere ihu nʼakụkụ ndịda ga-esi na Tama ruo nʼiyi Meriba Kadesh, sorokwa ọdọ mmiri Ijipt ruo nʼosimiri Mediterenịa.
EZE 48:29 “Nke a bụ ala unu ga-ekenye ebo Izrel niile dịka oke ha. Ha ga-abụkwara ha ihe nketa.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
EZE 48:30 “Ndị a ga-abụ ọnụ ụzọ ama e si apụ nʼobodo ahụ. “Nʼakụkụ nke ugwu, nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ,
EZE 48:31 ọnụ ụzọ ama obodo ahụ ga-abụ aha ebo niile nke Izrel. Ọnụ ụzọ ama atọ nʼakụkụ ugwu ga-abụ ọnụ ụzọ ama Ruben, ọnụ ụzọ ama Juda, na ọnụ ụzọ ama Livayị.
EZE 48:32 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nke mgbidi ya dị kilomita abụọ nʼogologo, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya. Ha ga-aza ọnụ ụzọ ama Josef, ọnụ ụzọ ama Benjamin, na ọnụ ụzọ ama Dan.
EZE 48:33 Nʼakụkụ ndịda, nke ogologo ya bụkwa kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama Simiọn, ọnụ ụzọ ama Isaka, na ọnụ ụzọ ama Zebụlọn.
EZE 48:34 Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama Gad, ọnụ ụzọ ama Asha, na ọnụ ụzọ ama Naftalị.
EZE 48:35 “Gburugburu obodo ahụ bụ kilomita iri. “Aha a ga-akpọ obodo ahụ site nʼoge ahụ gawa, ga-abụ, ‘Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ.’ ”
DAN 1:1 Mgbe afọ atọ gafere site na mgbe Jehoiakim bidoro bụrụ eze na-achị Juda, Nebukadneza eze na-achị Babilọn bịara buso Jerusalem agha.
DAN 1:2 Onyenwe anyị nyefere Jehoiakim, eze Juda nʼaka ya, na ihe ụfọdụ e jiri chọọ ụlọnsọ Chineke mma. O buuru ha niile gawa Shaịna nʼụlọ chi ya, dobe ha nʼime nʼụlọakụ chi ya.
DAN 1:3 Eze nyere Ashipenaz, onyeisi ndị ozi ya iwu ka ọ kpọbata ụmụ okorobịa sitere nʼezinaụlọ eze na nke ndị ọchịchị nʼala Izrel nʼije ozi eze.
DAN 1:4 Ụmụ okorobịa ndị a ga-abụ ndị nʼenweghị nkwarụ ọbụla nʼahụ ha, ndị mara mma ile anya na ndị nwere nghọta banyere ihe ọmụma dị iche iche. Ha kwesikwara ịbụ ndị maara ihe, ndị na-amụta ihe ọsịịsọ na ndị tozuru oke ije ozi nʼụlọeze. Ọ ga-akụziri ha asụsụ na akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche nke ndị Kaldịa.
DAN 1:5 Onye eze si nʼoche nri ya na-ewepụta nri na mmanya a ga-enye ha kwa ụbọchị. Ha ga-anọ nʼọzụzụ a afọ atọ, nke ọ ga-abụ e mechaa, ha ga-abụ ndị kwesiri ịnọ nʼije ozi nʼobi onye eze.
DAN 1:6 Ndị so nʼime ha bụ Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ha bụ ndị Juda.
DAN 1:7 Ma onyeisi ndị na-ejere eze ozi nyere ha aha ọhụrụ ọzọ Daniel ka ọ kpọrọ Belteshaza; Hananaya ka ọ kpọrọ Shedrak; ọ kpọrọ Mishael, Mishak; kpọkwa Azaraya, Abednego.
DAN 1:8 Ma Daniel kpebiri nʼobi ya na ọ gaghị emerụ onwe ya site nʼiri nri maọbụ ịṅụ mmanya eze. Ya mere ọ rịọrọ onyeisi ndị ozi ka ọ hapụ ya ka ọ ghara imerụ onwe ya.
DAN 1:9 Ma Chineke mere ka Daniel nweta ihuọma na obi ebere nʼaka onyeisi ndị na-ejere eze ozi. O nwekwara ọmịiko nʼebe Daniel nọ nʼihi ọnọdụ ha.
DAN 1:10 Ma onyeozi a gwara Daniel, “Ana m atụ egwu nʼihi onyenwe m eze, onye kwuru ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ. Ọ bụrụ na ọ hụ na unu tara ahụ karịa ndị ọgbọ unu ndị ọzọ, ndụ m ga-anọ na nsogbu nʼaka onye eze.”
DAN 1:11 Daniel sịrị onyeisi ahụ e tinyere ọrụ ilekọta Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya nʼaka,
DAN 1:12 “Biko, nye anyị naanị ahịhịa nri, na mmiri ọṅụṅụ, ka ọ bụrụ ihe oriri anyị na ihe ọṅụṅụ anyị. Jiri ya lee anyị ule ụbọchị iri.
DAN 1:13 Jirizie anya gị chọpụta ma o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ndị ọzọ, ndị na-eri nri ọma nke eze nyere, site nʼihe ị hụrụ, mee ụmụodibo gị otu o kwesiri.”
DAN 1:14 O kwenyere ime ihe ha kwuru, ọ nwalere ha abalị iri.
DAN 1:15 Mgbe ụbọchị iri ahụ zuru, a chọpụtara na ahụ dị ha mma, chọpụtakwa na ha dị mma ile anya karịa ụmụ okorobịa ndị ọzọ e ji nri ọma niile eze nyere zụọ.
DAN 1:16 Ya mere onyeisi ozi ahụ wepụrụ nri na mmanya ọma ahụ ha kwesiri iri ma nye ha naanị akwụkwọ nri.
DAN 1:17 Chineke mere ka ụmụ okorobịa anọ ndị a nwee ọgụgụisi pụrụ iche na nghọta nʼihe ọbụla gbasara edemede na amamihe niile. Daniel nwekwara nghọta ịkọwa ụdị ọhụ niile na nrọ niile.
DAN 1:18 Mgbe oge eze nyere a ga-eji kpọbata ha nʼije ozi ya zuru, onyeisi ndị na-eje ozi chere ha nʼihu Nebukadneza.
DAN 1:19 Ha na eze kparịtakwara ụka. Ma nʼime ụmụ okorobịa ahụ niile a zụrụ, o nweghị nke amamihe ya juru eze afọ dịka amamihe Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya. Nʼihi nke a, o mere ka ha soro bụrụ ndị na-adụ ya ọdụ.
DAN 1:20 Mgbe ọ bụlakwa eze chọrọ ndụmọdụ banyere amamihe na nghọta, ọ na-achọpụta na ndụmọdụ ha na-enye ya na-adị mma okpukpu iri karịa ndụmọdụ nke ndị majiki ya na ndị maara ihe banyere kpakpando nọ nʼalaeze ya na-enye ya.
DAN 1:21 Daniel nọgidere bụrụ onye na-adụ eze ọdụ tutu ruo afọ mbụ nke Sairọs bidoro ịchị dịka eze.
DAN 2:1 Nʼime afọ nke abụọ nke ọchịchị ya, eze Nebukadneza rọrọ nrọ dị iche iche. Nrọ ndị a mere ka obi ya gbasasịa, ụra pụkwara ya nʼanya.
DAN 2:2 Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị majiki, ndị ha na mmụọ ọjọọ na-ekwu okwu, ndị mgbaasị na ndị ihe banyere ngagharị nke kpakpando doro anya ka ha bịa gwa ya ihe ahụ ọ rọrọ na nrọ. Mgbe ha bịara, guzo nʼihu eze,
DAN 2:3 ọ sịrị ha, “Arọrọ m nrọ nke na-enye m nsogbu nʼobi. Achọrọ m ịma ihe ọ pụtara.”
DAN 2:4 Mgbe ahụ, ndị ahụ na-enyocha kpakpando gwara eze ahụ okwu nʼasụsụ ndị Siria sị, “Ka gị eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, Ị ga-agwa ụmụodibo gị nrọ a ị rọrọ, anyị ga-akọwara gị ihe ọ pụtara.”
DAN 2:5 Ma eze zara ndị Kaldịa, “Nke a bụ ihe m kpebirila: Ọ bụrụ na unu agwaghị m ihe nrọ a na nkọwa ya bụ, aga m eme ka abọkasịa unu, tikpọkwa ụlọ unu, mee ka ha ghọọ mkpọmkpọ ebe.
DAN 2:6 Ma ọ bụrụ na unu gwa m ihe ahụ m rọrọ na nrọ ma kọwaakwa ya, aga m enye unu onyinye dị iche iche na ụgwọ ọrụ nsọpụrụ dị ukwuu. Ya mere, gwanụ m nrọ ahụ na nkọwa ya.”
DAN 2:7 Ọzọkwa, ha zaghachiri, “Ka eze gwa ndị ohu ya ihe ọ rọrọ na nrọ, anyị ga-akọwakwa ya.”
DAN 2:8 Eze zaghachiri, “Ama m na ọ bụ oge ka unu na-achọ inweta nʼihi na unu amatala na ihe a ka m kpebiri ime.
DAN 2:9 Ọ bụrụ na unu agwaghị m nrọ ahụ naanị otu ntaramahụhụ dịịrị unu. Unu agbaala izu ịgwa m okwu ụgha na okwu nduhie na-ele anya na ọnọdụ ga-agbanwe. Ya mere, gwanụ m nrọ ahụ, m ga-amatakwa na unu pụrụ ịkọwara m ya.”
DAN 2:10 Ndị Kaldịa zara eze, “Ọ dịghị mmadụ ọbụla nʼelu ụwa a nke nwere ike ime ihe a eze na-achọ. Ọ dịghịkwa eze, nʼagbanyeghị ịdị ukwuu ya na ịdị ike ya, nke jụtụrụla ụdị ihe dị otu a eze na-ajụ nʼaka ndị mgbaasị, ndị na-agba aja ya, ndị ha na mmụọ ọjọọ na-ekwu okwu, na ndị Kaldịa.
DAN 2:11 Ihe a ị chọrọ ka anyị mee bụ ihe na-agaghị ekwe omume. Ọ bụ naanị ndị mmụọ nwere ike ịkọrọ gị ihe ị rọrọ na nrọ. Ndị mmụọ anọkwaghị nʼetiti ndị mmadụ.”
DAN 2:12 Nke a mere ka eze jupụta nʼoke iwe na ọnụma, o nyere iwu ka e gbuchaa ndị amamihe niile nke Babilọn.
DAN 2:13 Mgbe e kwupụtara iwu onye eze ka e gbuo ndị oke amamihe niile, ndị agha chọkwara ebe Daniel na ndị otu ya nọ ka ha gbuo ha.
DAN 2:14 Mgbe Ariok, onye bụ onyeisi ndị nche eze pụrụ igbu ndị ikom maara ihe na Babilọn, Daniel ji amamihe na ezi uche gwa ya okwu.
DAN 2:15 Ọ jụrụ onyeozi eze, bụ Ariok, “Gịnị mere eze ji nye iwu dị ike dị otu a?” Mgbe ahụ, Ariok kọwaara ihe niile nye Daniel.
DAN 2:16 Mgbe ahụ, Daniel banyere nʼụlọeze, ịhụ ya. Ọ rịọrọ eze ka o nyetụ ya nwa oge iji kọwaakwara ya ihe nrọ ahụ pụtara.
DAN 2:17 Emesịa, Daniel lara nʼụlọ nke ya gaa kọọrọ Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ndị enyi ya ihe merenụ.
DAN 2:18 Ọ gwara ha ka ha rịọọ maka ebere site nʼaka Chineke nke eluigwe banyere ihe nzuzo a, ka a hapụ igbu ya na ndị enyi ya na ndị amamihe fọdụrụ na Babilọn.
DAN 2:19 Nʼabalị, e mere ka Daniel mata ihe omimi ahụ site nʼọhụ. Mgbe ahụ, Daniel toro Chineke nke eluigwe,
DAN 2:20 Daniel sịrị, “Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi; amamihe na ike dị nʼaka ya.
DAN 2:21 Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche; Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha. Ọ na-enye onye maara ihe amamihe, ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma.
DAN 2:22 Ọ na-ekpughe ihe dị omimi na ihe zoro ezo; Ọ maara ihe dị nʼọchịchịrị, ma ìhè binyekwara ya.
DAN 2:23 Ana m ekele gị, na-etokwa gị, Chineke nke nna m ha, nʼihi na i nyela m amamihe na ike. I meela ka m mata ihe anyị rịọrọ gị, i mekwala ka anyị mata nrọ ahụ eze rọrọ.”
DAN 2:24 Nʼihi ya, Daniel jekwuru Ariok, onye ahụ eze nyere iwu igbu ndị ndụmọdụ niile dị na Babilọn, sị ya, “Egbukwala onye ọbụla nʼime ndị amamihe Babilọn. Kama duru m gaa nʼihu eze nʼihi na ejikeere m ịgwa ya ihe ahụ ọ chọrọ ịmata.”
DAN 2:25 Mgbe ahụ, Ariok mere ngwangwa duru Daniel gaa nʼihu eze, sị ya, “Achọpụtala m otu onye nʼime ndị Juda a dọtara nʼagha nwere ike ịgwa eze ihe nrọ ya pụtara.”
DAN 2:26 Eze jụrụ Daniel (onye a na-akpọkwa Belteshaza), “I nwere ike ịgwa m ihe ahụ m rọrọ na nrọ, na ịkọwara m ihe ọ pụtara?”
DAN 2:27 Daniel gwara eze, “O nweghị onye amamihe ọbụla, onye ọbụla ya na mmụọ na-ekwu okwu, onye mgbaasị ọbụla maọbụ onye na-enyocha kpakpando ọbụla pụrụ ịgwa eze ihe omimi a ị chọrọ.
DAN 2:28 Ma o nwere Chineke nọ nʼeluigwe, onye na-ekpughe ihe omimi niile. O gosila Nebukadneza ihe ga-eme nʼụbọchị ndị dị nʼihu. Nrọ gị na ọhụ niile nke gara nʼuche gị mgbe ị dinara nʼihe ndina gị bụ ndị a:
DAN 2:29 “Ihe ị rọrọ na nrọ, gị bụ eze, bụ ihe banyere ihe na-aga imezu nʼoge dị nʼihu. Onye ahụ na-ekpughe ihe nzuzo niile egosikwala gị ihe nke ga-eme.
DAN 2:30 Ma mụ onwe m, ekpugheghị ihe omimi a nye m nʼihi na m karịrị mmadụ ọbụla dị ndụ nʼamamihe, kama ọ bụ ka gị bụ eze mata nkọwa ya ma ghọtakwa ihe gabigara nʼuche gị.
DAN 2:31 “Eze, ihe ị hụrụ nʼọhụ bụ nke a. Ị hụrụ mmadụ a kpụrụ akpụ. Mmadụ a a kpụrụ akpụ buru nnọọ ibu. Ọ na-egbukwa nweghenweghe, bụrụkwa ihe na-eyi onye ọbụla lekwasịrị ya anya egwu.
DAN 2:32 E ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ isi mmadụ ahụ, jiri ọlaọcha kpụọ aka ya na obi ya. E jikwa bronz kpụọ afọ ya na apata ụkwụ ya.
DAN 2:33 Ọ bụkwa igwe ka e ji kpụọ ogwe ụkwụ ya abụọ. Ma akụkụ ụkwụ ya, nke a na-azọ nʼala ka e ji igwe a gwara ya na ụrọ kpụọ.
DAN 2:34 Mgbe ị na-ele anya, a wapụtara nkume, ma ọ bụghị aka mmadụ ka e ji wapụta ya. Nkume a kụrụ mmadụ ahụ a kpụrụ akpụ nʼukwu nkume na ụrọ ya, kụpịasịa ha.
DAN 2:35 Mgbe ahụ, e tijisịrị igwe ahụ na ụrọ ahụ, bronz ahụ na ọlaọcha ahụ nakwa ọlaedo ahụ niile. Ha dịka igbugbo ọka nke na-adị nʼebe a na-azọcha ọka nʼoge okpomọkụ. Ifufe fechapụsịrị ha na-ahapụghị ihe ngosi ọbụla. Ma nkume ahụ dakwasịrị ihe ahụ awuru awu mechara ghọọ ugwu dị ukwuu, nke jupụtara ụwa niile.
DAN 2:36 “Eze, nke a bụ nrọ ahụ. Ugbu a ka anyị kọwaara gị ihe nrọ ahụ pụtara.
DAN 2:37 Gị onwe gị, eze, bụ eze nke ọtụtụ ndị eze ọzọ nọ nʼokpuru ya, onye Chineke nke eluigwe nyere ike ọchịchị, nʼocheeze niile, na ike na otuto;
DAN 2:38 nyefeekwa nʼaka gị ụmụ mmadụ niile na ụmụ anụmanụ bi nʼime ọhịa, na ụmụ nnụnụ nke igwe, e mere ka ị bụrụ eze ihe niile ndị a, gị bụ isi ahụ e ji ọlaedo kpụọ.
DAN 2:39 “Mgbe ị chịchara alaeze ọzọ ga-ebili, ma ọ gaghị adị ukwuu dịka nke gị, mgbe nke a gasịrị, alaeze ọzọ bụ nke atọ, nke ga-adị ka bronz ga-ebilikwa, ọ ga-achị ụwa niile.
DAN 2:40 A ga-enwekwa alaeze nke anọ, nke ga-esi ike dịka igwe. Dịka igwe nke na-akụri ihe niile, ọ ga-egwepịa ma kụrikwaa ndị a niile.
DAN 2:41 Ma ebe ị hụrụ na ọbụ ụkwụ ahụ na mkpịsịụkwụ ya niile na ụfọdụ nʼime ha bụ ụrọ ọkpụ ite na ụfọdụ bụkwa igwe, alaeze nke ekewara ekewa ka ọ ga-abụ, ma ọ ga-esitụ ike dịka igwe nke dị nʼime ya, nʼihi na ị hụrụ igwe ahụ na agwakọtara ya na ụrọ apịtị.
DAN 2:42 Dịka mkpịsịụkwụ ya, nke ụfọdụ nʼime ya bụ igwe, ụfọdụ bụkwa ụrọ, na-egosi na akụkụ ụfọdụ nke alaeze ahụ ga-esi ike ma akụkụ ụfọdụ agaghị esi ike ntiwa.
DAN 2:43 Dịka otu ahụ ị hụrụ e siri gwakọta igwe na ụrọ ọnụ, otu a ka ọchịchị alaeze ndị a ga-achọ njikọta alaeze na ibe ya, ma nke a agaghị ekwe mee, dịka ọ gaghị ekwe omume bụ ịgwakọta igwe na ụrọ.
DAN 2:44 “Nʼoge ahụ, ndị eze ndị a ga-anọ nʼọchịchị, Chineke nke eluigwe ga-eme ka alaeze ọzọ bido. Ọ bụkwa alaeze nke a na-apụghị imebi emebi. O nwekwaghị onye ọbụla pụrụ imeri alaeze ahụ. Ọ ga-ala alaeze ndị ọzọ nʼiyi, mee ka ha bụrụ ihe efu, ma ọ ga-adịrị na-aga nʼihu ruo ebighị ebi.
DAN 2:45 Dịka i siri hụ nkume ahụ dị ukwuu e sitere nʼugwu wapụta, nke a na-ejighị aka wapụta were kụrichaa igwe ahụ, bronz ahụ, ụrọ ahụ, ọlaọcha ahụ na ọlaedo ahụ. “Chineke dị ukwuu emeela ka eze mara ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Nrọ a bụ eziokwu, nkọwa ya kwesikwara ntụkwasị obi.”
DAN 2:46 Mgbe ahụ, eze Nebukadneza dara nʼala nʼihu Daniel nye ya nsọpụrụ. O nyekwara iwu ka eweta onyinye na ụda na-esi isi ụtọ were chụnyere ya aja.
DAN 2:47 Onye eze gwakwara Daniel, “Nʼezie, Chineke gị bụ Chineke kachasị chi niile. Ọ bụ ya na-achị eze niile bi nʼụwa, bụrụkwa Onye na-ekpughepụ ihe omimi niile, nʼihi na lee, i nwere ike ịkọwa ihe omimi nke a.”
DAN 2:48 Emesịa eze nyere Daniel ọkwa dị ukwuu, nyekwa ya ọtụtụ onyinye dị iche iche. O mere ya onyeisi na-achị ala Babilọn niile, meekwa ya onyeisi ndị ndụmọdụ eze niile.
DAN 2:49 Ma dịka Daniel siri rịọ eze, o mekwara ka Shedrak, Mishak na Abednego bụrụ ndị na-elekọta ihe niile a na-eme eme nʼala Babilọn, Daniel nʼonwe ya nọdụrụ nʼogige eze.
DAN 3:1 Eze Nebukadneza kpụrụ oyiyi ọlaedo nke ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-adị ka mita atọ. Emesịa, o debe ya nʼobosara ala Dura, nke dị nʼotu mpaghara Babilọn.
DAN 3:2 Eze Nebukadneza ziri ozi ka e zie ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile, ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, ka ha bịa nʼụbọchị a ga-edo oyiyi ahụ nsọ bụ nke eze Nebukadneza guzobere.
DAN 3:3 Ya mere, ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile na ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, zukọtara maka ido oyiyi ahụ nke eze, bụ Nebukadneza guzobere nsọ. Ha niile guzooro ọtọ nʼihu oyiyi ahụ bụ nke eze Nebukadneza guzobere.
DAN 3:4 Onye nkwusa kwuru okwu nʼolu ike, “Mmadụ niile si na mba niile na asụsụ niile dị iche iche bịa, ka a na-enye iwu nke a,
DAN 3:5 mgbe ọbụla unu nụrụ ụda ọja, une, ụbọ akwara, maọbụ ụda ihe egwu ọbụla, unu ga-ada nʼala kpọọ isiala nye ihe a Nebukadneza eze ji ọlaedo kpụọ.
DAN 3:6 Onye ọbụla juru ịkpọ isiala ka a ga-atụba ngwangwa nʼime ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.”
DAN 3:7 Ya mere, ngwangwa ha nụrụ ụda opi ike, nke ọja, une ụbọ akwara, nke une na nke egwu dị iche iche, ndị niile si mba dị iche iche, ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, dara nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ, nke eze bụ Nebukadneza guzobere.
DAN 3:8 Nʼoge a, ụfọdụ nʼime ndị Kaldịa pụtara nʼihu boo ndị Juu ebubo.
DAN 3:9 Ha gwara eze, bụ Nebukadneza, “Ka eze dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
DAN 3:10 Gị, onwe gị nyere iwu, na onye ọbụla nụrụ ụda opi ike, ọja, une, ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ ga-akpọ isiala sekpuoro ihe ahụ e ji ọlaedo kpụọ,
DAN 3:11 na onye ọbụla jụrụ ịkpọ isiala ka a ga-atụba nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu.
DAN 3:12 Ugbu a, e nwere ụfọdụ ndị Juu, ndị aha ha bụ Shedrak, na Mishak na Abednego, ndị i mere ka ha bụrụ ndị na-elekọta ihe niile a na-eme eme nʼala Babilọn; ha aṅaghị ntị nʼiwu eze nyere, jụkwa ịkpọ isiala nye oyiyi a i ji ọlaedo kpụọ.”
DAN 3:13 Nebukadneza nʼọnọdụ oke iwe nyere iwu ka a kpọta Shedrak, na Mishak, na Abednego. Ya mere, a kpọbatara ndị ikom a nʼihu eze,
DAN 3:14 Nebukadneza sịrị ha, “Ọ bụ eziokwu, Shedrak, na Mishak, na Abednego, na unu adịghị efe chi m maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ m guzobere?
DAN 3:15 Mgbe unu nụrụ ụda opi, ọja, une na ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ, ọ bụrụ na unu adaa nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ahụ a kpụrụ akpụ, ihe niile ga-adị mma. Kama ọ bụrụ na unu ajụ ịkpọ isiala, a ga-atụnye unu ngwangwa nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. Kedụ chi ahụ nke pụrụ ịnapụta unu site nʼaka m?”
DAN 3:16 Shedrak, na Mishak, na Abednego, gwara eze, “O Nebukadneza, ọ dịghị mkpa na anyị ga-azara ọnụ anyị nʼihu gị banyere okwu a.
DAN 3:17 Ọ bụrụ Chineke anyị na-efe nwere ike ịzọpụta anyị site nʼọkụ na-enwusi ike nʼaka gị, ya zọpụta anyị.
DAN 3:18 Ma ọ bụrụkwa na ọ zọpụtaghị anyị, mata nke ọma, o eze, na anyị agaghị efe chi gị ndị a maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi a ị kpụrụ akpụ nke ị guzobere.”
DAN 3:19 Mgbe ahụ, Nebukadneza jupụtara nʼoke iwe megide Shedrak, na Mishak, na Abednego, nke bụ nʼihu ya gbarụrụ nʼebe ha nọ. O nyere iwu sị ka e mee ụlọ ọkụ ahụ ka ọ dị ọkụ ugboro asaa karịa ka o kwesiri.
DAN 3:20 Ọ nyere ụfọdụ ndị kacha sie ike nʼetiti ndị agha ya iwu ka e kee Shedrak, na Mishak, na Abednego eriri nʼụkwụ na aka, tụbakwa ha nʼọkụ ahụ na-enwu enwu.
DAN 3:21 Ya mere, ha kere ndị ikom ahụ agbụ ebe ha ka yi uwe ụkwụ ha, na akwa nkụkụ isi ha, na uwe mwụda ha, na uwe ha niile, tụba ha nʼetiti ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu.
DAN 3:22 Ebe ọ bụ nʼokwu eze dị ọkụ ọkụ, tinyere na ọkụ ahụ na-enwusi ike, o mere ka ire ọkụ regbuo ndị agha ahụ tụbara Shedrak, na Mishak, na Abednego.
DAN 3:23 Ya mere, Shedrak, na Mishak, na Abednego ndị e kesịrị agbụ ike, dabara nʼime ọkụ ahụ na-enwusi ike.
DAN 3:24 Nʼọnọdụ iju anya, Eze Nebukadneza wuliri nʼụkwụ ya, jụọ ndị ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị ndị ikom atọ anyị kere agbụ ka anyị tụbara nʼime ọkụ?” Ha zara eze, “Ọ bụ ezie, eze.”
DAN 3:25 Ọ sịrị, “Ma ana m ahụ mmadụ anọ ndị a na-ekeghị agbụ, ka ha na-agagharị nʼime ọkụ ahụ. Leekwa na ọkụ ahụ anaghị ere ha. Onye ahụ mere ha mmadụ anọ yiri nwa nke ndị bụ chi.”
DAN 3:26 Mgbe ahụ Nebukadneza, bịara nso nʼọnụ ụzọ oke ọkụ ahụ sị, “Shedrak, Mishak na Abednego, ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu, pụtanụ! Bịanụ nʼebe a!” Ya mere, Shedrak, Mishak na Abednego, sitere nʼoke ọkụ ahụ pụta.
DAN 3:27 Ụmụ ndị eze niile, ndịisi niile, ndị ahụ niile na-achị achị na ndị ndụmọdụ eze niile, zukọtara gburugburu ndị ikom atọ ahụ, ha hụkwara na ọkụ emerụghị ha ahụ, na o rechapụghịkwa agịrị isi dị ha nʼisi, uwe ha ereghịkwa ọkụ, isisi anwụrụ ọkụ adịghịkwa nʼahụ ha.
DAN 3:28 Mgbe ahụ, Nebukadneza sịrị, “Otuto dịrị Chineke nke Shedrak, Mishak na Abednego nʼihi na o zitere mmụọ ozi ya ịzọpụta ndị ohu ya tụkwasịrị ya obi, mgbe ha jụrụ ime ihe eze nyere nʼiwu, kama ha jiri aka ha họrọ ịnwụ, kama ife chi ọzọ nke na-abụghị Chineke nke ha.
DAN 3:29 Ya mere, ana m enye iwu a taa, na-asị na onye ọbụla, maọbụ mba ọbụla, maọbụ asụsụ ọbụla, onye kwuru okwu ọjọọ megide Chineke Shedrak, Mishak na Abednego, a ga-etikpọkwa ụlọ onye ahụ, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe. Nʼihi na o nweghị chi ọzọ nke pụrụ ịzọpụta nʼụzọ dị otu a.”
DAN 3:30 Mgbe ahụ, eze nyere Shedrak, Mishak na Abednego ọkwa ọzọ dị elu karịa nke ha nwere na mbụ nʼala Babilọn.
DAN 4:1 Mụ bụ Nebukadneza, Na e zigara mmadụ niile, mba niile, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche nʼụwa ozi: Ka ọ dịrị unu na mma!
DAN 4:2 E ji m obi ụtọ, na-eme ka unu mata ihe ịrịbama niile na ihe iju anya niile, nke Chineke Onye kachasị ihe niile elu meere m.
DAN 4:3 Lee ka ihe ịrịbama ya,
DAN 4:4 Mụ onwe m, bụ Nebukadneza nọ nʼafọ ojuju na ihe ịga nke ọma nʼụlọeze m.
DAN 4:5 Arọrọ m nrọ, nke mere ka ụjọ tụọ m. Ihe niile m hụrụ na nrọ mgbe m dina ala nʼelu akwa mere ka oke ụjọ tụọ m.
DAN 4:6 Nʼihi ya, enyere m iwu ka a kpọọ ndị amamihe niile m nwere na Babilọn ka ha bịa nʼihu m, bịa kọwaara m isi nrọ ahụ.
DAN 4:7 Ma mgbe ndị mgbaasị, ndị dibịa, ndị Kaldịa na ndị na-agba afa bịara, a kọọrọ m ha nrọ ahụ m rọrọ, ma ha enweghị ike ịgwa m nkọwa ya.
DAN 4:8 Nʼikpeazụ, Daniel batara nʼihu m, onye aha ya bụ Belteshaza dịka aha chi m si dị, onye mmụọ nke chi niile dị nsọ bi nʼime ya. Akọọrọ m ya ihe ahụ m rọrọ na nrọ.
DAN 4:9 Asịrị m, “Belteshaza, onyeisi ndị nkọwa ihe niile. Amaara m na mmụọ nke chi niile dị nsọ bi nʼime gị. Amakwaara m na o nweghị ihe omimi ọbụla ga-esiri gị ike ịchọpụta ọsịsa ya. Ugbu a, nke a bụ nrọ m, kọwaara m ihe ọ pụtara.
DAN 4:10 Mgbe m dina nʼelu akwa, nke a bụ ihe m hụrụ. E nwere otu osisi nke toro nʼetiti ụwa, ogologo ya dị ukwuu.
DAN 4:11 Osisi a toro sie ike, ịdị elu ya rukwara nʼeluigwe, a na-ahụkwa ya anya site na nsọtụ nke ụwa niile.
DAN 4:12 Akwụkwọ ya dị mma ile anya, alaka ya jupụtakwara na mkpụrụ hiri nne, o gbokwara mkpa nri nye mmadụ niile. Ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na-abịakwa nʼokpuru ndo ya izuike. Ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe na-ebikwa nʼalaka ya. Ọ bụkwa site na ya ka a na-azụ ihe niile dị ndụ nri.
DAN 4:13 “Mgbe m nọkwa na-arọ nrọ ahụ, ahụrụ m otu nʼime ndị mmụọ ozi Chineke ka o si nʼeluigwe na-arịdata.
DAN 4:14 O tiri mkpu nʼolu dị ike sị, ‘Gbudanụ osisi ukwu ahụ, gbukasịakwa alaka ya niile. Kụpụsịanụ akwụkwọ ndụ niile dị nʼelu ya. Ghasaakwanụ mkpụrụ ya niile, ka ụmụ anụmanụ si nʼokpuru ndo ya gbapụ, ka ụmụ nnụnụ site nʼalaka ya fepụ.
DAN 4:15 Kama hapụnụ ogwe osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya ka ha dịrị nʼime ala, ebe e ji ụdọ igwe na ụdọ bronz kee ya gburugburu, ebe ahịhịa ndụ gbakwara ya gburugburu. “ ‘Ka igirigi nke eluigwe zoo ya nʼahụ, ka ahịhịa bụrụkwa nri ọ ga-eri, ya na ụmụ anụmanụ.
DAN 4:16 Ka uche ya gbanwee ghọọ nke anụ ọhịa, ghara ibu nke mmadụ, afọ asaa.
DAN 4:17 “ ‘Nke a bụ mkpebi nke mmụọ ozi ahụ nọ na nche. Ọ bụkwa mkpebi e nyere site nʼokwu nke dị nsọ, ka ụwa niile mata na Onye kachasị ihe niile elu, na-achịkwa nʼalaeze niile dị nʼụwa. Ọ bụ ya na-ewerekwa alaeze ndị a nye onye ọbụla ọ chọrọ, ọ bụladị ndị mmadụ a na-ahụta dịka ndị dị ala karịsịa.’
DAN 4:18 “Nke a bụ nrọ ahụ, mụ bụ eze Nebukadneza rọrọ, ugbu a, Belteshaza, gwa m ihe bụ nkọwa ya. Nʼihi na ndị amamihe niile nọ nʼalaeze m enweghị ike ịkọwara m ya. Ma amaara m na i nwere ike ịkọwara m ya, nʼihi na mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ dị nʼime gị.”
DAN 4:19 Mgbe ahụ Daniel (onye a na-akpọkwa Belteshaza), nọ nʼoke ihe iju anya nʼihi na echiche ya mere ka ọma jijiji. Ya mere, eze sịrị, “Belteshaza, atụkwala egwu nʼihi nrọ a maọbụ ihe ọ pụtara.” Belteshaza zara sị, “Onyenwe m, ka nrọ a dịrị ndị kpọrọ gị asị, ka nkọwa ya dịkwara ndị iro gị.
DAN 4:20 Osisi ahụ ị hụrụ nke buru ibu, tokwa ogologo ma dịkwa ike, nke elu ya na-emetụ mbara eluigwe, nke ndị niile bi nʼụwa hụrụ,
DAN 4:21 nke nwekwara akwụkwọ ndụ dị mma, na nke jupụtara na mkpụrụ, nke na-egboro mmadụ niile mkpa nri, nke ụmụ anụmanụ ọhịa niile na-ebi nʼokpuru ndo ya, nke ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe nwere akwụ ebe obibi ha,
DAN 4:22 osisi ahụ bụ gị onwe gị, eze. Nʼihi na i toola bụrụ onye dị ike na onye dị ukwuu. Ịdị ukwu gị eruola nʼeluigwe. Ọchịchị gị eruokwala nʼakụkụ niile nke ụwa.
DAN 4:23 “Mgbe ahụ, ị hụkwara onye dị nsọ na-enyocha omume ndị mmadụ nke si nʼeluigwe rịdata na-asị, ‘Gbutuonụ osisi a, laa ya nʼiyi, ma unu hapụ ogwe ya ka ahịhịa ndụ gbaa ya gburugburu, ka e jirikwa ụdọ igwe na bronz kee ya gburugburu; hapụ ya ka igirigi nke eluigwe zokwasị ya. Hapụkwa ya ka o soro anụ ọhịa taa ahịhịa dịka nri ya tutu afọ asaa a gafee.’
DAN 4:24 “Eze, nke a bụ nkọwa nrọ ị rọrọ, Onye kachasị ihe niile elu enyela iwu nke na-aghaghị imezu megide onyenwe m eze.
DAN 4:25 A ga-achụpụ gị site nʼebe ndị mmadụ nọ. A ga-achụgakwa gị nʼebe gị na ụmụ anụmanụ ga-ebi nʼọhịa, Ebe ahụ ka ị ga-anọ taa ahịhịa dịka oke ehi, igirigi nke eluigwe ga-ezokwasịkwa gị. Ọnụọgụgụ afọ asaa ga-agabiga tutu ruo mgbe ị nabatara na Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke mmadụ, na ọ bụkwa nʼaka onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-enyefe ha.
DAN 4:26 Dịka e siri nye nʼiwu ka a hapụ ogwe osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya nʼime ala. Nke a na-egosi na ị ga-emecha nwetaghachi alaeze gị mgbe ị nabatara na Eluigwe na-achị achị.
DAN 4:27 Ya mere, biko eze, kweere nabata ndụmọdụ m, kwụsị ime mmehie, mee ihe ziri ezi, werekwa omume ileta ndị ogbenye dochie nʼọnọdụ ajọ omume gị. Eleghị anya, ihe ga na-agara gị nke ọma.”
DAN 4:28 Ma ihe ndị a niile bịakwasịrị eze Nebukadneza.
DAN 4:29 Mgbe ọnwa iri na abụọ gafesịrị ọ nọ na-agagharị nʼelu ụlọ dị nʼụlọeze nʼobodo Babilọn.
DAN 4:30 Ma eze sịrị, “Ebe a, ọ bụghị Babilọn dị ukwu, nke m wuuru onwe m dịka ebe obibi m, site nʼike m dị ukwu na maka ebube ọchịchị m?”
DAN 4:31 Mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, otu olu si nʼeluigwe kwuo okwu, “Ihe a ka e kpebiri megide gị, eze Nebukadneza. Site taa gaa nʼihu ị gaghị abụkwa eze na-achị alaeze a.
DAN 4:32 A ga-esi nʼetiti ndị mmadụ chụpụ gị, ka ị gaa soro ụmụ anụmanụ biri nʼọhịa. Ị ga-atakwa ahịhịa dịka oke ehi, afọ asaa ga-agasị tutu ruo mgbe ị ghọtara na ọ bụ Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze dị niile nke ụwa. Ọ na-enyefekwa ha nʼaka onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ chịa.”
DAN 4:33 Nʼotu oge ahụ kwa, okwu ndị a e kwuru banyere Nebukadneza mezuru. E sitere nʼetiti ụmụ mmadụ chụpụ ya, ọ gakwara nʼọhịa taa ahịhịa dịka oke ehi, igirigi nke eluigwe dekwara ahụ ya ruo mgbe ajị dị ya nʼahụ toro ogologo dịka nku ugo, mbọ ụkwụ na aka ya dịkwa ka mbọ ụmụ nnụnụ.
DAN 4:34 Mgbe oge a gafesịrị, mụ bụ Nebukadneza leliri anya m elu. Mgbe ahụ kwa ka m ghọrọ mmadụ nwere uche ọzọ. Etokwara m, ma kpọọkwa isiala nye Onye ahụ kachasị ihe niile elu, sọpụrụkwa Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi.
DAN 4:35 Mmadụ niile bi nʼụwa
DAN 4:36 Mgbe uche m laghachiri dịka mmadụ, enwetaghachikwara m ugwu na nsọpụrụ na alaeze m. Ndị na-adụ m ọdụ laghachikwara bịakwute m, ha na ndị na-ejere m ozi. E mekwara ka m bụrụkwa eze ọzọ nʼalaeze m. Ugwu na nsọpụrụ m nwere ugbu a karịrị ugwu na nsọpụrụ m nwere nʼoge gara aga.
DAN 4:37 Ugbu a, mụ bụ Nebukadneza na-eto, na-asọpụrụ Eze nke eluigwe, nʼihi na ọrụ ya niile dị mma, ụzọ ya niile kwụ ọtọ. Nʼihi na o nwere ike ijide ndị nganga kwanye ha ọnụ nʼime ntụ.
DAN 5:1 Eze Belshaza, kpọrọ puku ndịisi nọ nʼalaeze ya oriri, ebe ha nọ ṅụọ nnọọ mmanya dị ukwuu.
DAN 5:2 Mgbe Belshaza na-aṅụ mmanya ya, ọ nyere iwu ka a chịtara ya iko ọlaedo na ọlaọcha nke nna ya bụ Nebukadneza si nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem chịkọta, ka eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya, na ndị nwunye ya, na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya.
DAN 5:3 Ya mere, a chịtara iko ọlaedo ndị e si nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem chịkọta. Eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya na ndị nwunye ya na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya.
DAN 5:4 Ha ṅụrụ mmanya tookwa chi nke ọlaedo na ọlaọcha na bronz, na igwe na osisi na nkume.
DAN 5:5 Na mberede, ha hụrụ mkpịsịaka mmadụ ka ọ na-ede ihe nʼaja ụlọ nke ụlọeze ahụ ha nọ nʼime ya, na ncherita ihu ebe a dọbara iheọkụ. Eze nʼonwe ya hụrụ aka ahụ mgbe ọ na-ede ihe ahụ.
DAN 5:6 Mgbe ahụ, ihu eze ahụ tụhịkọtara, gbarụọ nʼihi egwu. Oke ụjọ tụrụ ya. Ụkwụ ya makwara jijiji. Ikpere ya abụọ kụkọtara onwe ha.
DAN 5:7 Eze kpọrọ mkpu ka a kpọbata ndị dibịa niile na ndị Kaldịa, na ndị na-akọwa maka njegharị nke kpakpando. Mgbe ahụ eze sịrị ndị ikom amamihe nke Babilọn, “Onye ọbụla nwere ike gụọ ihe ahụ e dere, nke nwekwara ike ịkọwara m ihe ọ pụtara, ka a ga-eyikwasị uwe odo odo nke ndị eze. A ga-anyakwasị ya ihe olu ọlaedo. A ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze a.”
DAN 5:8 Mgbe ahụ, ndị amamihe eze batara, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha pụrụ ịgụta, maọbụ ịkọwara eze ihe ọ pụtara.
DAN 5:9 Nke a mere, ka eze Belshaza maa jijiji karịa, ihu ya gburu maramara ma gbarụkwaa. Ọ gbakwara ndị ozi ya gharịị.
DAN 5:10 Mgbe eze nwanyị, nụrụ olu eze na olu ndị a mara aha ha nʼala ya, ọ batara nʼụlọ oriri ahụ. Eze nwanyị sịrị, “Eze, dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi; ka ihe a mere ghara iwetara gị ihu mgbarụ, atụla ụjọ.
DAN 5:11 Nʼihi na o nwere otu nwoke nọ nʼalaeze gị, onye mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ bi nʼime ya. Nʼoge ahụ nna gị bụ eze, a chọpụtara na nwoke a jupụtara nʼamamihe na nghọta, dịka a ga-asị na ya onwe ya bụ chi. Nna gị eze Nebukadneza mere ya onyeisi ndị amamihe niile, ndị dibịa, ndị na-enyocha kpakpando, ndị Kaldịa na ndị mgba afa niile.
DAN 5:12 Ebe ọ bụ na ezigbo mmụọ, mmụta na nghọta nke e ji akọwa nrọ na ihe mgbagwoju anya, na igbo mkpa dị iche iche, dị nʼime nwoke a a na-akpọ Daniel, nke eze kpọrọ Belteshaza. Ugbu a, zie ozi ka a kpọọ Daniel ka ọ kọwara gị ihe a.”
DAN 5:13 Ya mere, a kpọbatara Daniel nʼihu eze, eze sịrị Daniel, “Ọ bụ gị bụ Daniel, otu nʼime ndị Juda, ndị nna m dọtara nʼagha site na Juda?
DAN 5:14 Anụla m na i nwere mmụọ nke chi niile nʼime gị, na ị bụkwa onye jupụtara na nghọta na amamihe.
DAN 5:15 Ndị amamihe m, na ndị na-enyocha kpakpando abịala nʼihu m ịgụ ihe ahụ e dere nʼaja ụlọ ma ha enweghị ike ịgụta ya maọbụ ịkọwa ihe ọ bụ.
DAN 5:16 Agwara m na i nwere ike ịkọwa ihe ọbụla gbagwojuru anya. Ọ bụrụ na i nwee ike ịgụ ihe e dere nʼaja ma kọwakwara m ihe ọ pụtara, aga m eyikwasị gị uwe odo odo ndị eze, yinyekwa gị ihe olu ọlaedo nʼolu, meekwa ka i bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze m.”
DAN 5:17 Daniel zara nʼihu eze, “Debere onwe gị onyinye gị, ma ọ bụkwanụ were ya nye onye ọzọ. Ma aga m agụrụ gị eze ihe ahụ e dere ma kọwakwara gị ihe ọ pụtara.
DAN 5:18 “Gị eze, Chineke nke kachasị ihe niile elu nyere nna gị, Nebukadneza ike ọchịchị a, na ịdị ukwu, na ebube, na ịma mma.
DAN 5:19 Nʼihi ọkwa dị ukwuu nke o nyere ya, ndị niile, na mba niile di iche iche, na-asụ asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa na-ama jijiji na-atụkwa ya egwu. Ndị eze chọrọ igbu ka o gburu, ọ hapụkwara onye ọbụla ọ chọrọ ịhapụ; o buliri onye ọbụla ọ chọrọ ibuli elu, ma ndị ọ chọrọ iweda nʼala, ka ya onwe ya wedakwara nʼala.
DAN 5:20 Ma mgbe nganga na ịnya isi jupụtara ya obi, Chineke sitere nʼocheeze ya wezuga ya, napụkwa ya ebube o nwere dịka eze.
DAN 5:21 A chụpụrụ ya site nʼetiti ụmụ mmadụ, nyekwa ya echiche uche dịka nke anụmanụ. Ọ bụkwa nʼetiti ụmụ ịnyịnya ibu ọhịa ka ebe obibi ya dị, o soro ha taa ahịhịa dịka oke ehi. Igirigi nke eluigwe deekwara ahụ ya, tutu ruo mgbe ọ matara na Chineke Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-eguzobe ka ọ chịa.
DAN 5:22 “Ma gị nwa ya, O Belshaza, ewedaghị onwe gị ala, nʼagbanyeghị na i ma ihe ndị a niile.
DAN 5:23 Nʼihi na i lelịala Chineke nke eluigwe. Ị wepụtara iko ndị a e si nʼụlọnsọ ukwu ya chịpụta, ka gị na ndịisi alaeze gị, ndị nwunye ha na ndị iko unu, jiri ṅụọ mmanya, mgbe unu nọ na-eto chi niile nke e jiri ọlaọcha na ọlaedo, bronz na igwe, osisi na nkume kpụọ; chi nke na-adịghị ahụ ụzọ, maọbụ nụ ihe; chi nke na-amaghị ihe ọbụla. Ma unu enyeghị Chineke onye na-enye unu ume ndụ na onye ndụ gị na ọganihu gị dị nʼaka ya nsọpụrụ.
DAN 5:24 Ọ bụ nke a mere o ji zite aka ahụ ị hụrụ, nke depụtara ozi a.
DAN 5:25 “Nke a bụ ozi ahụ e dere: mene, mene, tekel, parsin
DAN 5:26 “Ihe okwu ndị a pụtara bụ nke a: “Mene, Chineke agụkọọla ụbọchị ọchịchị gị, mee ka ha bịa na njedebe.
DAN 5:27 “Tekel, atụọla gị nʼime ihe ọtụtụ chọpụta na o nweghị ihe ọbụla ị bụ.
DAN 5:28 “Parsin, ekewala alaeze gị nyefee ya nʼaka ndị Midia na Peshịa.”
DAN 5:29 Mgbe ahụ Belshaza nyere iwu ka e yikwasị Daniel uwe odo odo ndị eze ahụ, ka e yinye ya ihe olu ọlaedo. O nyekwara iwu ka e kwusaa nʼalaeze ya niile, na o meela ya onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze ahụ.
DAN 5:30 Nʼabalị ụbọchị ahụ kwa ka e gburu Belshaza eze ndị Kaldịa.
DAN 5:31 Nʼabalị ahụ kwa ka Daraiọs onye Midia, bidoro ịchị dịka eze. Ọ gbara iri afọ isii na abụọ nʼoge o bidoro ịchị.
DAN 6:1 Ọ dị Daraiọs mma ịhọpụta ndịisi dị otu narị na iri abụọ, ndị ga-anọ nʼalaeze ahụ niile dịka ndị nnọchite anya eze.
DAN 6:2 O họpụtakwara ndịisi atọ ọzọ dịka ndịisi ha, nke otu onye nʼime ha bụ Daniel. Ndị a bụ ndị ga na-agụkọrọ ha otu ihe si aga, ka ihe ọbụla ghara ifunarị eze.
DAN 6:3 Ọ dịghị anya, ọ pụtara ihe nye eze na Daniel kwesiri ntụkwasị obi karịa ndịisi na ndị nlekọta ahụ niile. Nʼihi na amamihe ya, na ike ọrụ ya dị ukwuu. Nke a mere ka eze chee echiche kpebie ime ya onyeisi nʼalaeze niile.
DAN 6:4 Nʼihi nke a, ndịisi ọkwa ha dị elu na ndịisi ndị ọzọ bidoro chọwa mkpesa ha ga-enye iji megide Daniel nʼihe gbasara ọchịchị. Ma ọ dịghị ihe ebubo ọbụla maọbụ omume ọjọọ ọbụla ha chọpụtara, nʼihi na ọ kwesiri ntụkwasị obi. Ọ dịghịkwa omume ọjọọ maọbụ nke aghụghọ ọbụla a chọpụtara nʼọrụ ya.
DAN 6:5 Nʼikpeazụ, ndị ikom a sịrị, “O nweghị otu anyị ga-esi chọta ihe a ga-eji boo nwoke a bụ Daniel ebubo, karịakwa nʼihe metụtara iwu ofufe Chineke ya.”
DAN 6:6 Ya mere, ndịisi ndị a na ndị ozi ndị ahụ kpebiri jekwuru eze ahụ sị ya, “Eze Daraiọs, dịrịkwa ndụ ruo mgbe niile!
DAN 6:7 Ndịisi alaeze gị niile, ndị ukwu na ndị nta, ndị na-anọchi anya eze na ndị ndụmọdụ na ndị ị tinyere ka ha na-achị zukọtara kpebie na eze kwesiri inye iwu nke ga-ekwu na a chọghị ka onye ọbụla rịọọ ihe ọbụla nʼaka chi maọbụ nʼaka mmadụ ọbụla karịa gị eze, site nʼoge i nyere iwu a tutu iri ụbọchị atọ agafee. Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm.
DAN 6:8 Anyị chọkwara ka gị bụ eze kwagide iwu a ma jirikwa aka gị dee aha gị nʼakwụkwọ iwu ahụ. Nʼihi na anyị chọrọ ka ọ bụrụ iwu nke na-agaghị enwe mgbanwe, nke a na-apụghị ịkagbukwa akagbu, dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị.”
DAN 6:9 Ya mere, Daraiọs jiri aka ya dee aha ya nʼakwụkwọ iwu ahụ.
DAN 6:10 Ma mgbe Daniel maara na iwu a adịla ire, ọ banyere nʼụlọ ya, nʼelu ụlọ elu nke ebe obibi ya, o meghere oghereikuku ya chere ihu na Jerusalem. Nʼebe ahụ ka ọ na-anọ ekpe ekpere na ekele Chineke ya, ugboro atọ nʼụbọchị dịka ọ na-eme na mbụ.
DAN 6:11 Ndị iro ya gbakọtara hụ na Daniel na-ekpe ekpere na-arịọkwa Chineke arịrịọ.
DAN 6:12 Ha jekwuru eze sị ya, “I chetakwara iwu ahụ i nyere, nke sị na onye ọbụla ekwesighị ịrịọ chi ọzọ maọbụ mmadụ arịrịọ ọbụla karịa gị, tutu iri ụbọchị atọ agafee, na onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm?” Eze sịrị, “Ya bụ iwu ka dịkwa, dịka iwu ndị Midia na Peshịa nke e nweghị ike ịkagbu akagbu.”
DAN 6:13 Mgbe ahụ, ha gwara eze, “Daniel, onye bụ otu nʼime ndị si Juda a dọtara nʼagha adịghị aṅa gị ntị, gị onye a na-asọpụrụ, maọbụ nye iwu ahụ i nyere bụ nke e dere nʼakwụkwọ. Ọ nọkwa na-ekpe ekpere ya ugbo atọ nʼụbọchị.”
DAN 6:14 Obi jọrọ eze njọ nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe ndị a. O kpebiri nʼobi ya ime ihe niile ịhụ na Daniel ataghị ahụhụ. Ya mere, ụbọchị ahụ niile, site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, ọ nọ na-eche otu ọ ga-esi mee nke a.
DAN 6:15 Mgbe ahụ, ndị ikom ndị a bịakwutere eze sị ya, “Chetakwa, gị eze, na dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị, ọ dịghị iwu ọbụla eze nyere maọbụ ụkpụrụ nke e mere ka o guzosie ike ga-agbanwe.”
DAN 6:16 Nʼikpeazụ, eze nyere iwu, ha kpụpụtara Daniel tụba ya nʼolulu ọdụm. Eze gwara Daniel, “Ka Chineke gị, onye ahụ ị na-efe mgbe niile, zọpụta gị.”
DAN 6:17 E wetara nkume dị ukwuu jiri mechie ọnụ olulu ọdụm ahụ. Eze jikwa mgbaaka akara ya na mgbaaka ndịisi ọzọ kaa akara e ji nyachie ọnụ olulu ahụ. E mere nke a ka ọnọdụ Daniel hapụ ịgbanwe.
DAN 6:18 Mgbe eze lọbatara nʼụlọeze ya, o dinara nʼihe ndina ya buo ọnụ, onweghịkwa nri ebutere ya. Nʼabalị ahụ, o nweghị ike rahụ ụra.
DAN 6:19 Nʼìhè mbụ nke ụtụtụ, mgbe chị na-abọ, eze biliri mee ngwangwa, gaa nʼolulu ọdụm ahụ.
DAN 6:20 Mgbe ọ bịaruru nso olulu ahụ, ọ kpọrọ Daniel oku nʼolu obi ntiwa sị, “Daniel, ohu Chineke dị ndụ, Chineke gị ahụ ị na-efe mgbe niile, o nwekwara ike ịzọpụta gị nʼaka ọdụm?”
DAN 6:21 Ya mere, Daniel sịrị eze, “Eze, dịrị ndụ ruo mgbe niile!
DAN 6:22 Chineke m zitere mmụọ ozi ka o mechie ọnụ ọdụm ndị a, ka ha si otu a hapụ inwe ike ịmetụ m aka, nʼihi na Chineke maara na aka m dị ọcha. Ọ makwaara na o nweghị ihe ọbụla m mere mejọọ gị.”
DAN 6:23 Ọṅụ juru eze ahụ obi! O nyere iwu ka e si nʼime olulu ahụ dọpụta Daniel. Mgbe a kpọpụtara Daniel, o nweghị ihe ọbụla a hụrụ mere ya nʼahụ, nʼihi na ọ tụkwasịrị Chineke ya obi.
DAN 6:24 Mgbe ahụ, eze nyere iwu ka e jide ndị ahụ boro Daniel ebubo. O nyere iwu ka a tụnye ha nʼolulu ọdụm ahụ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha. Ọdụm ndị ahụ dị nʼime olulu ahụ jidere ndị ahụ dọrie ma ọkpụkpụ ha tupu ha adaruo ala.
DAN 6:25 Emesịa, eze Daraiọs depụtara ozi a nʼakwụkwọ nye iwu ka a gụọra ya mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa. “Ka ọ dịrị unu na mma.
DAN 6:26 “Ana m enye iwu na mmadụ niile nọ nʼalaeze m kwesiri ịtụ egwu na ịma jijiji nʼihu Chineke nke Daniel.
DAN 6:27 Ọ na-agbapụta ndị ya, na-azọpụtakwa.
DAN 6:28 Ya mere, ihe gaara Daniel nke ọma nʼoge niile Daraiọs bụ eze, na nʼoge Sairọs onye Peshịa chịkwara dịka eze.
DAN 7:1 Nʼafọ mbụ, mgbe Belshaza bidoro ịchị ala Babilọn, Daniel rọrọ nrọ, hụkwa ọhụ dị iche iche, o dere ihe ndị ahụ nʼakwụkwọ.
DAN 7:2 “Mụ bụ Daniel hụrụ nʼime ọhụ m nʼabalị, elere m anya, hụ nʼihu m oke ifufe anọ nke eluigwe ka ha na-atụgharị oke osimiri.
DAN 7:3 Anụ ọhịa anọ buru ibu si nʼime osimiri ahụ rịpụta. O nweghị nke yiri ibe ya.
DAN 7:4 “Nke mbụ dị ka ọdụm, kama o nwere nku dịka ugo. Mgbe m nọ na-ele ya anya, a nyakapụrụ nku ya, welie ya, hapụ ya ka o guzo nʼelu ala nʼụkwụ ya abụọ dịka mmadụ. E nyekwara ya ụdị obi nke mmadụ nwere.
DAN 7:5 “Anụ ọhịa nke abụọ yiri anụ ọhịa buru ibu a na-akpọ bịa (nʼasụsụ bekee). E weliri ya nʼotu akụkụ, ọ kpụkwa ọgịrịga atọ nʼọnụ ya, nʼetiti eze ya. A gwara ya, ‘Bilie, rie anụ ka o si dị gị mma.’
DAN 7:6 “Mgbe nke a gasịrị, ka m nọ na-ele anya, anụ ndọgbu ọzọ pụtara, anụ ọhịa ahụ yiri agụ, ma o nwere nʼazụ ya nku anọ dịka nke nnụnụ. O nwekwara isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị.
DAN 7:7 “Mgbe nke a gasịrị, nʼime ọhụ nke abalị, ahụrụ m anụ ọhịa nke anọ. Anụ ọhịa a na-eyi oke egwu, ọnụ apụghị ịkọwa ihe o yiri. Ọ bụkwa anụ ọhịa dị nnọọ ike, nke na-eji eze igwe ya dị ukwuu na-adọwasị ma na-etipịasịkwa ihe ọbụla, nke na-ejikwa ụkwụ ya azọgbu ihe ọbụla fọdụrụ. Ọ bụ anụ ọhịa gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, bụrụkwa anụ nwere mpi iri.
DAN 7:8 “Mgbe m nọ na-eche banyere mpi ndị a, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwa nʼetiti ha pupụta. E si nʼukwu hopu mpi atọ nʼime mpi iri mbụ ahụ nʼihu ya. Mpi ntakịrị a nwere anya dịka mmadụ, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi.
DAN 7:9 “Anọkwa m na-ele anya “hụ ka e doziri ocheeze, ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ. Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo, agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha. Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ, ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ.
DAN 7:10 Iyi na-asọ ka ọkụ si nʼihu ya na-asọpụta. Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi. Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya. Ndị ikpe nọdụrụ ala, asaghekwara akwụkwọ dị iche iche.
DAN 7:11 “Mgbe m nọ na-ele anya, nʼihi okwu ịnya isi nke mpi ahụ na-ekwu, elegidere m anya tutu ruo mgbe e gburu anụ ọhịa ahụ, laa anụ ahụ ya nʼiyi, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ.
DAN 7:12 (Gbasara ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ, a napụrụ ha ọchịchị ha, ma a hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ gaa nʼihu nwantakịrị oge).
DAN 7:13 “Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya.
DAN 7:14 E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.
DAN 7:15 “Mụ onwe m, bụ Daniel, ọhụ a m hụrụ tụrụ mmụọ m ụjọ nke ukwuu, mekwa ka obi m ma jijiji.
DAN 7:16 Ejekwuuru m otu nʼime ndị guzo nʼebe ahụ nso jụọ ya ihe ihe ndị a niile pụtara. “Ọ gwara m ma kọwakwara m ihe ihe ndị a pụtara.
DAN 7:17 ‘Anụ ọhịa anọ ndị a bụ alaeze anọ nke ga-ebili nʼụwa.
DAN 7:18 Ma ọ bụ ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ga-anara alaeze. Ọ ga-abụkwa nke ha ruo mgbe ebighị ebi.’
DAN 7:19 “Mgbe ahụ, achọrọ m ịmata ihe banyere anụ ọhịa nke anọ ahụ, nke ahụ gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, na-eyikwa oke egwu, nke nwere eze dịka igwe, na mbọ yiri nke e ji bronz kpụọ. Nke ahụ na-adọwasị ndị mmadụ, na nke na-azọgbukwa ndị fọdụrụ.
DAN 7:20 Asịkwa m ya kọwaara m ihe mpi iri ahụ dị ya nʼisi pụtara, na ihe banyere mpi nke ọzọ puputara, na ihe mere e ji nyakapụ mpi atọ ahụ nʼihi ya. Asị m ya kọwakwara m ihe banyere mpi ahụ, nke nwere anya, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi, ma dịkwa ka ọ dị ike karịa ndị ọzọ.
DAN 7:21 Mgbe m na-ele anya, ahụrụ m ka mpi a na-alụso ndị nsọ ọgụ na-emerikwa.
DAN 7:22 Tutu ruo mgbe onye ahụ na-adị site na mbụ bịara kpee ikpe nke gaara ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ma oge bịakwara mgbe ha natara alaeze ahụ.
DAN 7:23 “Nke a bụ ihe o kwuru: ‘Anụ ọhịa nke anọ a bụ alaeze nke ga-apụta nʼụwa. Ọ ga-adị iche site nʼalaeze ndị ọzọ. Ọ ga-azọpịa, kụrie, ma bibiekwa ụwa niile.
DAN 7:24 Mpi iri ahụ nọchiri anya ndị eze iri ga-esi nʼalaeze ya pụta. Mgbe ndị eze a ga na-achị, eze ọzọ, nke dị iche site na ndị bụrụ ya ụzọ ga-ebilikwa, ma merie ndị eze atọ ndị ọzọ ahụ ma laa ha nʼiyi.
DAN 7:25 Ọ ga-ekwu okwu kwugide Onye kachasị ihe niile elu. O ga-emekpa ndị nsọ ahụ. Ọ ga-agbalịkwa ịgbanwe iwu niile na omenaala niile. A ga-enyefe ndị nsọ nʼaka ya afọ atọ na ọkara.
DAN 7:26 “ ‘Ma a ga-emeghe ụlọ ikpe, napụkwa ya ike niile, kpochapụ ya ma laakwa ya nʼiyi kpamkpam.
DAN 7:27 Mgbe ahụ, ike ọchịchị, ike na ịdị ukwuu nke alaeze niile dị nʼokpuru eluigwe ka a ga-enyefe nʼaka ndị nsọ, bụ ndị nke Onye ahụ kachasị ihe niile elu. Alaeze ya ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị niile na-achị achị ga-erubere ya isi, kpọọkwa isiala nye ya.’
DAN 7:28 “Nke a bụ ọgwụgwụ okwu ahụ. Mụ onwe m, bụ Daniel, echiche m mere ka m tụọ egwu nke ukwu, ihu m gbanwere dịka onye ahụ na-adịghị, ma o nweghị onye ọbụla m gwara ihe m hụrụ.”
DAN 8:1 Nʼafọ nke atọ site na mgbe eze Belshaza bidoro ịbụ eze, mụ bụ Daniel hụrụ ọhụ ọzọ.
DAN 8:2 Nʼime ọhụ, ahụrụ m onwe m nʼobodo Susa, nke bụ obodo ukwu ebe eze nwere isi ọchịchị ya, nʼobodo dị na mpaghara Elam. Eguzokwara m nʼakụkụ osimiri Ulai.
DAN 8:3 Eweliri m anya elu, hụ otu ebule nwere mpi ogologo abụọ ka o guzo nʼakụkụ iyi, otu nʼime mpi abụọ ya ahụ bidoro ito ogologo karịa nke ọzọ.
DAN 8:4 Mgbe m na-ele anya, ebule ahụ malitere iji mpi ya na-asọ ihe o bụla dị nʼọdịda anyanwụ na nʼugwu nakwa na ndịda. O nweghị anụ ọbụla nwere ike iguzogide ya, o nwekwaghị onye ọbụla pụrụ inyere ndị ọ lụsoro ọgụ aka. O mere ihe ọbụla masịrị ya si otu a dị ukwuu.
DAN 8:5 Mgbe m nọ na-atule nke a, na mberede ahụrụ m otu mkpi si nʼọdịda anyanwụ pụta, na-agafe ụwa niile ma ụkwụ erughị ya ala. Mkpi a, nwere otu mpi nʼetiti anya abụọ ya.
DAN 8:6 Ọ bịaruru nso ebule ahụ nwere mpi abụọ nke m hụrụ guzo nʼakụkụ mmiri, were oke iwe na-agbata ọsọ nʼebe ọ nọ.
DAN 8:7 Ahụrụ m ka o ji oke iwe lụso ebule ahụ ọgụ kujipụ mpi abụọ ya. Ebule ahụ enweghị ike iguzogide ya. Ọ tụdara ya nʼala, were ụkwụ ya zọda ya, ma na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịnapụta ebule ahụ site nʼike ya.
DAN 8:8 Mkpi ahụ, dịịrị ike nke ukwu, ma nʼuju ike ya a gbajipụrụ mpi ukwu ya. Nʼọnọdụ mpi ahụ mpi anọ puputara chee ihu nʼakụkụ anọ nke eluigwe,
DAN 8:9 Otu ntakịrị mpi sitere nʼime otu nʼime mpi ndị ahụ pụta, tokwaa ma buo ibu nke ukwuu ruo na ndịda, na ọwụwa anyanwụ, ruokwa nʼala ọma ahụ
DAN 8:10 O toro tutu o ruo usuu nke eluigwe. Ọ kwatukwara ụfọdụ nʼime usuu nke eluigwe na ụfọdụ nʼime kpakpando nʼala, zọtọọ ha.
DAN 8:11 O mere onwe ya ka ọ dị ukwuu megide onyeisi nke usuu eluigwe, ọ napụrụ ya aja niile a na-achụ kwa ụbọchị ma tụdakwa ebe nsọ ya nʼala.
DAN 8:12 Nʼihi nnupu isi, e nyefere usuu ndị nsọ na aja nsure ọkụ a na-esure kwa ụbọchị nʼaka ya. Ọ gara nʼihu nʼihe niile o mere. E mekwara ka eziokwu daa nʼala.
DAN 8:13 Mgbe ahụ, anụrụ m ka otu mmụọ ozi na-ajụ ibe ya sị, “Olee mgbe ọ ga-akwụsị bụ ọhụ maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa ụbọchị, njehie nke na-eweta ịtọgbọ nʼefu, inyefe ebe nsọ na maka ndị nsọ a na-azọtọ ụkwụ?”
DAN 8:14 Ọ gwara m, “A ga-echere tutu puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị atọ agafee, mgbe ahụ a ga-eme ka ebe nsọ ahụ dịghachikwa otu ọ dị na mbụ.”
DAN 8:15 Mgbe mụ bụ Daniel nọ na-ele ọhụ ahụ na-achọkwa ịghọta ya, o nwere otu onye dịka nwoke bịara guzo nʼihu m.
DAN 8:16 Ma anụrụ m olu otu onye na-akpọ oku site na mmiri Ulai sị, “Gebrel, kọwaara nwoke a ihe ọhụ a pụtara.”
DAN 8:17 Mgbe ọ bịara m nso nʼebe m guzo, egwu tụrụ m nke ukwu. Adara m, kpuo ihu m nʼala. Ma ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ghọta na ọhụ a bụ maka ọgwụgwụ oge.”
DAN 8:18 Mgbe ahụ ọ na-agwa m okwu, adara m nʼoke ụra, kpuo ihu nʼala. Ma o metụrụ m aka, nyere m aka iguzo ọtọ nʼụkwụ m.
DAN 8:19 Ọ sịrị, “Lee, aga m agwa gị ihe na-aga ime nʼoge oke iwe. Nʼihi na ọhụ a bụ maka oge ọgwụgwụ ihe niile nke a kara aka.
DAN 8:20 Ma banyere ebule ahụ ị hụrụ nke nwere mpi abụọ, na-egosi eze Midia na Peshịa.
DAN 8:21 Mkpi ahụ ị hụrụ na-egosi eze ndị Griis, nnukwu mpi nke dị nʼetiti anya ya abụọ bụ eze nke mbụ.
DAN 8:22 Dịka mpi ahụ siri gbajie, mpi anọ ọzọ pupụta nʼọnọdụ ya, otu a ka alaeze anọ ga-esi pụta na mba ya, ma ike ha agaghị eru ka nke mbụ ahụ.
DAN 8:23 “Ma na mgbe ọgwụgwụ alaeze ahụ, mgbe iko ndị nnupu isi juru, otu eze nke nwere ihu dị ike, na akọnuche na obi aghụghọ ga-ebili.
DAN 8:24 Ọ ga-adị ike nke ukwuu, ma ọ bụghị nʼike onwe ya, ọ ga-eweta mbibi ga-eju anya. Ihe niile o metụrụ aka ga-agara ya nke ọma. Ọ ga-alakwa ndị dị ike na ndị nsọ nʼiyi.
DAN 8:25 Ọ ga-eme ka aghụghọ baa ụba, ọ ga-ahụta onwe ya dịka onye dị elu karịa, mgbe ndị mmadụ na-eche na udo dị, ọ ga-ebibi ọtụtụ ndị. Ọ ga-eguzo megide Onyeisi nke ndịisi, a ga-ebibi ya ma ọ bụghị nʼike nke mmadụ.
DAN 8:26 “Ọhụ a ị hụrụ, maka ụtụtụ na anyasị nke ekpughere gị bụ eziokwu, ma zobe ọhụ a, nʼihi na ọ dịrị ọtụtụ oge ka dị nʼihu.”
DAN 8:27 Mụ bụ Daniel, nọrọ nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ na ahụ esighị ike. Mgbe ụbọchị ole na ole gafekwara, ebiliri m bidokwa na-agagharị, na-arụkwa ọrụ eze, ma obi jọrọ m njọ nke ukwuu nʼihi nrọ ahụ, nʼihi na ọ karịrị m nghọta.
DAN 9:1 Nʼafọ mbụ, nke Daraiọs nwa Ahasuerọs (onye agbụrụ Midia), onye e mere eze nke alaeze ndị Kaldịa,
DAN 9:2 nʼafọ mbụ nke ọchịchị ya, ka mụ onwe m, bụ Daniel ghọtara site nʼakwụkwọ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Jeremaya onye amụma, nke ga-emezu mgbe Jerusalem ga-anọ na mbibi iri afọ asaa.
DAN 9:3 Nʼihi nke a, echere m Onyenwe anyị Chineke ihu, rịọ ya arịrịọ, site nʼekpere na arịrịọ amara, nʼibu ọnụ, na iyikwa akwa mkpe na ntụ.
DAN 9:4 Ekpere m ekpere nye Onyenwe anyị bụ Chineke m, ma kwupụta sị, “Onyenwe anyị, onye dị ukwuu, dị oke egwu. Onye na-edebe ọgbụgba ndụ nke ịhụnanya nke ndị hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile.
DAN 9:5 Ma anyị emehiela meekwa ihe nʼadịghị mma megide gị. Anyị emeela ajọ omume, anyị enupula isi megide gị, gbakụtakwa iwu gị niile azụ.
DAN 9:6 Anyị e geghịkwa ndị ozi gị bụ ndị amụma ntị, bụ ndị gwara ndị eze anyị, na ndị ọchịchị anyị, na nna anyị ha, ma mmadụ niile bi nʼala anyị okwu nʼaha gị.
DAN 9:7 “Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, ma nʼụbọchị taa anyị bụ ndị ihere dịrị, ndị Juda, ndị Jerusalem na ndị Izrel niile, ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya ebe ị chụgara ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi anyị nye gị.
DAN 9:8 Onyenwe anyị, ihere emegbuola anyị. Ihere dịrị ndị eze anyị, dịkwara ndịisi anyị na ndị nna anyị, nʼihi na anyị emeela mmehie megide gị.
DAN 9:9 Ma Onyenwe anyị Chineke anyị ka obi ebere na mgbaghara niile dịrị, nʼihi na anyị enupurula gị isi.
DAN 9:10 Anyị erubeghị isi nye Onyenwe anyị Chineke anyị, maọbụ debe iwu ahụ o nyere anyị site nʼaka ndị ohu ha bụ ndị amụma.
DAN 9:11 Ndị Izrel niile enupula isi nʼiwu gị, wezuga onwe ha, jụ ige gị ntị. “Ya mere, ọbụbụ ọnụ ahụ niile e dere nʼiwu Mosis, odibo nke Chineke adakwasịla anyị, nʼihi na anyị emehiela megide gị.
DAN 9:12 O meela ka okwu ya guzosie ike, bụ nke o kwuru megide anyị na ndị ndu anyị site nʼiwetara anyị oke mbibi a. Nke bụ na o nwebeghị mgbe ọbụla e merela ụdị ihe emere na Jerusalem nʼokpuru eluigwe.
DAN 9:13 Ọ bụ dịka e si dee ya nʼiwu Mosis, ka mbibi a niile bịakwasịrị anyị, ma anyị achọbeghị ihuọma Onyenwe anyị Chineke anyị, na ichegharị site na mmehie anyị chee uche banyere eziokwu gị.
DAN 9:14 Onyenwe anyị kpachara anya mee ka nsogbu a bịakwasị anyị. Nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke anyị, bụ onye ezi omume nʼihe niile ọ na-eme, ma anyị jụrụ irubere ya isi.
DAN 9:15 “Ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke, onye ji aka dị ike kpọpụta ndị nke ya nʼala Ijipt, i meere onwe gị aha nke na-adịgide ruo taa. Anyị mere mmehie, ma mejọọkwa.
DAN 9:16 Onyenwe anyị, dịka ezi omume gị si dị, wezuga iwe gị na oke iwe gị nʼebe Jerusalem nọ, bụ obodo gị, na ugwu nsọ gị. Mmehie anyị na njehie nna anyị ha emeela ka Jerusalem na ndị gị bụrụ ihe ịkwa emo nye ndị gbara anyị gburugburu.
DAN 9:17 “Ma ugbu a, Chineke anyị, biko nụrụ ekpere na arịrịọ ohu gị. Nʼihi aha gị, Onyenwe anyị jiri amara mee ka ihe si nʼihu gị mụkwasị ụlọnsọ gị nke tọgbọrọ nʼefu.
DAN 9:18 Chineke m, tọọ ntị gị nʼala nụrụ arịrịọ m. Meghee anya gị abụọ ka ị hụrụ ọnọdụ mbibi nke obodo a na-akpọ aha gị nọ. Anyị anaghị arịọ ka i nyere anyị aka nʼihi na anyị bụ ndị ezi omume, kama anyị na-arịọ nʼihi na ebere gị dị ukwuu.
DAN 9:19 Onyenwe anyị nụrụ! Onyenwe anyị, gbaghara anyị! Onyenwe anyị biko, gee ntị ma zaa anyị. Nʼihi aha gị, O Chineke m, anọkwala ọdụ, nʼihi obodo gị, na ndị nke gị bụ aha gị ka a na-akpọ ha.”
DAN 9:20 Mgbe m nọ na-ekwu okwu na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie m na mmehie ndị m Izrel, na-arịọkwa amara nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke m maka ugwu dị nsọ nke Chineke m,
DAN 9:21 ebe m ka nọ na-ekpere, Gebrel, nwoke ahụ m hụrụ nʼọhụ na mbụ, feere ọsịịsọ bịakwute m nʼoge a na-achụ aja nke uhuruchi.
DAN 9:22 Ọ bịara sị m, “Daniel, a bịara m ugbu a inye gị uche na nghọta.
DAN 9:23 Na mbido oge ị malitere ịrịọ arịrịọ, ka okwu ọsịsa pụtara. Abịara m ịgwa gị ya, nʼihi na ị bụ onye a na-akwanyere ugwu nke ukwuu. Ya mere, tụgharịa uche nʼokwu a, ghọtakwa ọhụ a.
DAN 9:24 “Iri izu ụka asaa, ka e dere nʼiwu nye ndị gị na obodo nsọ gị iji kwụsị njehie, ime ka mmehie kwụsị, na ịchụ aja maka ikpuchi ajọ omume na iweta ezi omume nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi, na ịkachi ọhụ na amụma ahụ akara, nakwa ite Ebe ahụ Kachasị Nsọ mmanụ.
DAN 9:25 “Ma mara, werekwa uche ghọta nke a: Site nʼoge e nyere iwu ka e wugharịa Jerusalem tutu ruo mgbe Onye ahụ e tere mmanụ, onyendu ahụ ga-abịa, ga-abụ izu ụka asaa, na izu ụka iri isii na abụọ, a ga-ewughachi ya, na okporoụzọ ya, na olulu mmiri ya, maọbụ nʼime oge nsogbu.
DAN 9:26 Mgbe izu ụka iri isii na abụọ gasịrị, Onye ahụ e tere mmanụ ka a ga-egbu, ma o nweghị ihe ọ ga-enwe. Usuu agha nke onye ọchịchị ga-abịa bibie obodo na ụlọnsọ. Oge ikpeazụ ga-abịa dịka idee mmiri; agha ga-adịgide ruo nʼoge ọgwụgwụ, e kpebiela na ịla nʼiyi ga-adị.
DAN 9:27 Ya na ọtụtụ ndị mmadụ ga-enwe ọgbụgba ndụ nʼotu ‘izu ụka,’ ọ bụkwa nʼọkara izu ụka ahụ, ka ọ ga-eme ka ịchụ aja na inye onyinye kwụsị. Ọ ga-emekwa ihe arụ dị egwu nʼime ụlọnsọ ahụ, ruo mgbe a ga-awụkwasị ya ọgwụgwụ ahụ bụ nke akara aka nʼahụ onye ọjọọ ahụ.”
DAN 10:1 Nʼafọ atọ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, e nyere Daniel (onye aha ya bụkwa Belteshaza mkpughe). Ozi ahụ bụ eziokwu, ọ gbasakwara oke ọgbaaghara. Ọ ghọtara ozi ahụ, nwetakwa nkọwa banyere ọhụ ahụ.
DAN 10:2 Nʼoge ahụ, mụ onwe m, bụ Daniel, ruru ụjụ izu ụka atọ.
DAN 10:3 Erighị m nri ọma ọbụla, erikwaghị m anụ, aṅụkwaghị m mmanya, eteghị m mmanụ otite ọbụla nʼahụ m nʼime izu ụka atọ a niile.
DAN 10:4 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ, eguzo m nʼakụkụ osimiri ukwu ahụ, bụ Taịgris,
DAN 10:5 eleliri m anya m elu, hụ nʼihu m otu nwoke yi uwe akwa ọcha, onye e kekwasịrị belịt e ji ọlaedo sitere Ụfaz mee nʼukwu ya.
DAN 10:6 Ahụ ya na-egbukwa maramara dịka nkume beril, ìhè si nʼihu ya dị ka ìhè nke amụma eluigwe. Mkpụrụ anya ya na-enwukwa dịka ire ọkụ. Ụkwụ ya na aka ya na-acha dịka bronz e hichara nke ọma. Okwu si ya nʼọnụ na-ada ụda dịka ụzụ nke ọtụtụ mmadụ.
DAN 10:7 Ọ bụ naanị m Daniel hụrụ ọhụ a. Ndị mụ na ha nọ ahụghị ya, kama na mberede, e mere ka oke egwu tụọ ha, nke mere ka ha gbara ọsọ gaa zoo onwe ha.
DAN 10:8 Ọ bụkwa naanị m nọ, mgbe m hụrụ oke ọhụ a. Mgbe m hụkwara ya, ike niile dị m nʼahụ si m nʼahụ pụọ. Ihu m gbanwere nke ukwuu, ike afọdụkwaghị m nʼahụ.
DAN 10:9 Mgbe ahụ, anụrụ m ụda olu ya, ma mgbe m nụrụ ụda olu ya, adara m nʼala kpudo ihu nʼala nʼọnọdụ ịda nʼoke ụra.
DAN 10:10 Ma otu aka metụrụ m, welite m mee ka m maa jijiji nʼelu ikpere m na aka m abụọ.
DAN 10:11 Ọ sịrị m, “Daniel, gị onye a hụrụ nʼanya nke ukwuu. Gee ntị tuleekwa nke ọma okwu niile m na-agwa gị ugbu a. Guzo nʼụkwụ gị abụọ, nʼihi na e zitere m ịbịakwute gị.” Mgbe ọ na-agwa m okwu a, eguzooro m ọtọ, na-ama jijiji.
DAN 10:12 Ọ sịrị m, “Egwu atụla gị, Daniel. Nʼihi na site nʼụbọchị mbụ i kpebiri inwe nghọta na iweda onwe gị ala nʼihu Chineke gị, ka a nụrụ okwu gị niile, a bịakwara m nʼihi ọsịsa ha.
DAN 10:13 Ma onyeisi ndị na-achị alaeze Peshịa gbochiri m, kemgbe iri ụbọchị abụọ na otu. Ya mere, Maikel, otu nʼime ndịisi ọchịchị bịara nyere m aka, nʼihi na mụ onwe m fọdụrụ nʼebe ahụ mụ na eze Peshịa.
DAN 10:14 Ugbu a, abịala m ime ka ị ghọta ihe ga-adakwasị ndị gị nʼoge ikpeazụ nʼụbọchị dị nʼihu. Nʼihi na ọhụ ndị a dịrị oge ndị na-abịa nʼihu.”
DAN 10:15 Mgbe ọ na-agwa m okwu ndị a, ekpunyere m ihu m nʼala enwekwaghị m ike ikwu okwu ọbụla.
DAN 10:16 Mgbe ahụ, otu onye, nke yiri mmadụ, bịara metụ egbugbere ọnụ m aka, mee ka m nwee ike ikwukwa okwu ọzọ. Mgbe ahụ agwara m onye ahụ nke guzo m nʼihu, “Anọ m nʼoke ihe mgbu; Onyenwe m, enwekwaghị m ike ọbụla, nʼihi ọhụ m hụrụ.
DAN 10:17 Olee otu mụ bụ ohu gị ga-esi gwa gị okwu, Onyenwe m? Nʼihi na ike adịghịkwa nʼime m, enwekwaghị m ike iku ume.”
DAN 10:18 Mgbe ahụ, otu onye yiri mmadụ bịara metụkwa m aka ọzọ nye m ike.
DAN 10:19 Ọ sịrị, “Onye a hụrụ nʼanya nke ukwu, atụkwala ụjọ, udo dịrị gị, ya mere dịrị ike, obi sie gị ike.” Mgbe ọ gwara m okwu a, ike m lọghachitere, asịrị m, “Ka onyenwe m kwuo okwu, ebe i nyeghachila m ike.”
DAN 10:20 Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ị maara ihe mere m ji bịakwute gị? Aga m alaghachi azụ ịlụso onyeisi na-achị alaeze Peshịa ọgụ, mgbe mụ ga-apụ, eze na-achị Griis ga-abịa;
DAN 10:21 ma otu ọ dị, aga m agwa gị ihe e dere nʼakwụkwọ nke eziokwu. (Ọ dịghị onye na-enyere m aka imegide ha ma ọ bụghị naanị Maikel onyeisi unu.
DAN 11:1 Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Daraiọs onye Midia, ọ bụ m guzoro inyere ya aka na ichekwa ya.)
DAN 11:2 “Ugbu a, aga m agwa gị eziokwu. A ga-enwe ndị eze Peshịa atọ ọzọ ndị ga-achịkwa. A ga-enwe eze nke anọ onye ga-aba ụba karịa ndị ọzọ niile. Mgbe ọ ga-adị ike site akụnụba ya, ọ ga-akpalị onye ọbụla imegide eze Griis.
DAN 11:3 Ma mgbe ahụ, a ga-enwe eze dị ike nke ga-eji oke ike chịa. Ọ ga na-eme ihe masịrị ya.
DAN 11:4 Ma mgbe ọ rịgotachara nʼọchịchị, a ga-ekposa alaeze ya kesaa ya nʼakụkụ anọ nke ụwa ma ọ bụghị ụmụ ya ga na-achị. Ọ bụghịkwa nʼusoro dịka ike ọchịchị ya si dị, nʼihi na a ga-ehopu alaeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ọzọ na-abụghị ndị agbụrụ ya.
DAN 11:5 “Eze nke ndịda ga-adị ike, ma otu onye nʼime ndịisi agha ya ga-adị ike karịa ya, chịakwa alaeze dị ukwu karịa nke ya
DAN 11:6 Mgbe afọ ole na ole gasịrị, ha ga-ekekọta onwe ha. Ada eze ndịda ga-agakwuru eze ugwu ka ha gbaa ndụ, ma ada eze agaghị ejigide ike ya, eze na ike ya agaghị adịgidekwa. Nʼụbọchị ndị ahụ, a ga-arara ada eze ahụ nye, ya na ndị na-eche ya nche, na nna ya na onye ahụ dịnyeere ya.
DAN 11:7 “Nʼoge ahụ, otu onye ga-esi nʼagbụrụ ụlọ nwanyị ahụ kulite i were ọnọdụ ya ịchị dịka eze, ọ ga-ebuso ndị agha eze mpaghara ugwu agha, bata nʼebe ya e wusiri ike, ọ ga-alụso ha agha ghọọ onye mmeri.
DAN 11:8 Ọ ga-ebukọrọ chi ha niile na arụsị ha niile awụrụ awụ ma ndị atụrụ atụ, na ihe ndị ọzọ dịkarịsịrị ha mkpa dịka efere, ọlaọcha na nke ọlaedo laa Ijipt. O mechaa nke a, ọ ga-akwụsị ịlụso eze ugwu ọgụ afọ ole na ole.
DAN 11:9 Otu a kwa, eze mpaghara ugwu ga-ebuso eze ndịda agha, ma ọ gaghị anọ ọdụ lọghachikwa nʼala nke ya.
DAN 11:10 Ma ụmụ ya ndị ikom ga-achịkọta ọtụtụ ndị agha siri ike, ndị ga-enupu dịka oke idee mmiri, buru agha ruo nʼebe ya e wusiri ike.
DAN 11:11 “Mgbe ahụ, eze ndịda, onye iwe ga-eju obi, ga-achịkọtakwa ndị agha nke ya buso eze ugwu agha, onye nke ga-achịkọta ọtụtụ ndị agha, ma ndị a ka ndị iro ya ga-alụgbu.
DAN 11:12 Ma mgbe o merichara ndị agha ahụ, ọ ga-enwe ọṅụ dị ukwu, ọ ga-egbukwa imerime puku ndị mmadụ, ma ọ gaghị emeri na-aga nʼihu.
DAN 11:13 Mgbe afọ ole na ole gafere, eze ndị mpaghara ugwu ga-eduru ndị agha ji ezi ngwa agha, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ karịa ndị nke e meriri nʼagha na mbụ pụọ ibu agha.
DAN 11:14 “Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị ga-ebili imegide eze ndịda, Ụfọdụ ndị ọkpa aghara nʼetiti unu ga-enupukwa isi, ha ga-esi otu a mezuo ihe a ị hụrụ nʼọhụ, ma a ga-emeri ha.
DAN 11:15 Mgbe ahụ, eze ndị mpaghara ugwu ga-abịa buo agha megide obodo ndị ndịda e wusiri ike, lụgbukwaa ya. Ndị agha agaghị enwe ike iguzogide ha ọ bụladị ndị ha bụ ọka ibe nʼagha.
DAN 11:16 Ma onye nke na-ebuso ya agha ga-eme ihe masịrị ya, ma o nweghị onye ga-egbochi ha. Ọ ga-abatakwa nʼAla Ọma ahụ, ebe ihe niile ga-anọ nʼokpuru ya.
DAN 11:17 Ọ ga-ekpebi ịbịa nʼike nke alaeze ya niile, iji mee nke a, ya na eze nke ndịda ga-agba ndụ. Ọ ga-enyekwa ya nwaagbọghọ iji kwatuo alaeze ya, ma ebumnobi ya agaghị eguzo maọbụ baara ya uru.
DAN 11:18 Mgbe ọ mesịrị nke a, ọ ga-eche ihu ya nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ osimiri. Ọ ga-emerikwa ọtụtụ nʼime ha. Ma otu ọchịagha ga-alụso ya ọgụ, mee ka o jiri ọsọ gbaghachi nʼihere.
DAN 11:19 Ọ ga-echigharị azụ chee ihu ya ebe niile e wusiri ike nke ala nke ya, ọ ga-asọ ngọngọ daa, a gaghị ahụkwa ya ọzọ.
DAN 11:20 “Otu onye ga-abịa nọchie ọnọdụ ya, ọ ga-ezipụ onye ga-ekegbu ndị mmadụ nʼụtụ iji mee ka otuto nke alaeze ahụ daa, ma nʼime ụbọchị ole na ole, a ga-egbu ya, ma ọ gaghị abụ nʼagha maọbụ nʼihu mmadụ.
DAN 11:21 “Nʼọnọdụ ya, otu onye ọjọọ e ledara anya ga-ebilite, onye na-ekwesighị iwere nsọpụrụ nke ya bụ ọchịchị. Ọ ga-abata nʼike nʼalaeze ahụ mgbe ndị ya nọ nʼudo, ọ ga-eji nwayọọ ma were ire ụtọ na aghụghọ nweta alaeze ahụ.
DAN 11:22 Mgbe ahụ, ọ ga-achụsasị igwe ndị agha niile, bibiekwa ha na onye ọchịchị nke ọgbụgba ndụ.
DAN 11:23 Mgbe ọ banyesịrị nʼọgbụgba ndụ, ọ ga-eji aghụghọ na-eme mpu, ọ ga na-esiwanye ike nʼagbanyeghị nʼọnụọgụgụ ndị mmadụ dị ole na ole.
DAN 11:24 Ọ ga-abanye nʼakụkụ ala ahụ niile a maara ndị bara ụba bi, mee nʼebe ahụ ihe ndị buru ya ụzọ na-emebeghị. Ọ ga-ekesara ndị mmadụ akụnụba na ihe nkwata ndị ọzọ ọ lụtara nʼagha. Ọ ga-atụpụta aro iji lụso obodo siri ike ọgụ, ma nke ahụ ga-adị nwa mgbe nta.
DAN 11:25 “Mgbe ahụ, ọ ga-emesi onwe ya obi ike, chịkọtaa ọtụtụ ndị agha ibuso eze ndịda agha. Eze ndịda ga-achịkọtakwa ndị agha dị ọtụtụ dịkwa ike lụso ya ọgọ ma ọ gaghị enwe ike guzogide ya nʼihi izuzu nzuzo a gbara megide ya.
DAN 11:26 Nʼihi na ndị na-eri ihe ọma eze ga-etipịa ya. A ga-achụsa ndị agha ya, ma gbukwaa ọtụtụ nʼọgbọ agha.
DAN 11:27 Ndị eze abụọ a, ndị obi ha jupụtara nʼihe ọjọọ ga-anọkọta nʼotu tebul na-agwarịta ibe ha okwu ụgha, ma nzukọ ha agaghị enwe isi, nʼihi ọgwụgwụ ahụ ga-adị mgbe a kara aka ruru.
DAN 11:28 Ọ ga-eji akụnụba dị ukwuu laghachi nʼobodo nke ya ma obi ya ga-adị imegide ọgbụgba ndụ nsọ ahụ. Ọ ga-ebili imegide ya ma mesịa laghachi nʼobodo nke aka ya.
DAN 11:29 “Ma mgbe oge ahụ a kara aka ruru, ọ ga-achịrịkwa ndị agha ya laghachi na ndịda, ma ihe agaghị adị otu ọ dị na mbụ.
DAN 11:30 Ụgbọ mmiri ndị si obodo Kitim ga-abịa imegide ya, ọ ga-ada mba nʼihi egwu, ọ ga-alaghachi azụ were oke iwe megide ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ. Ọ ga-alọghachi gosi ndị hapụrụ ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ nkwado.
DAN 11:31 “Ndị agha ya ga-ebili imerụ ebe ahụ e wusiri ike nke ụlọnsọ ukwu ahụ, kwụsịkwa aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị. Ha ga-ewuli ihe arụ nke na-eweta mbibi.
DAN 11:32 Ọ ga-eji ire ụtọ merụọ ndị ahụ mebiri iwu nke ọgbụgba ndụ. Ma ndị ahụ maara Chineke ha ga-adị ike guzogide ya.
DAN 11:33 “Ndị niile nwere uche ga-ezi ọtụtụ mmadụ ihe, ma na nwa oge nta, ụfọdụ ga-anwụ site na mma agha, ụfọdụ ka a ga-akpọ ọkụ, ụfọdụ ka a ga-adọta nʼagha, ụfọdụ kwa ka a ga-apụnara ihe ha nwere.
DAN 11:34 Mgbe ha ga-ada, inyeaka ntakịrị ga-abịara ha, ọtụtụ ndị mmadụ ga-ejikwa ụzọ aghụghọ bịa dịnyere ha.
DAN 11:35 Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị maara ihe ga-asọ ngọngọ, ka ha nwe ike bụrụ ndị a nụchara anụcha, na ndị a sachapụrụ ọcha na ndị emere ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ tutu ruo nʼọgwụgwụ ihe ndị a, nʼihi nʼoge ahụ ga-abịa mgbe akara aka.
DAN 11:36 “Eze ahụ ga-eme ihe ọbụla ọ chọrọ. Ọ ga-agụkwa onwe ya dịka onye dị ukwuu karịa chi niile. Nʼezie, ọ ga-ekwu okwu nkwulu megide Chineke kachasị chi niile. Ma ihe ga-agakwara ya nke ọma tutu mgbe oge ya zuru. Nʼihi na ihe niile ekwuru ga-emezucha.
DAN 11:37 Ọ gaghị akpọ chi nke nna ha maọbụ nke ahụ ụmụ nwanyị na-achọsi ike ihe ọbụla, o nweghị chi ọbụla ọ ga-akpọ ihe nʼihi na ọ ga-ebuli onwe ya elu karịa ha niile.
DAN 11:38 Kama chi nke ọ ga-asọpụrụ bụ chi nke ebe e wusiri ike, chi nke nna ya ha na-amaghị. Ọ ga-eji ọlaedo na ọlaọcha, na nkume dị oke ọnụahịa na onyinye dara oke ọnụahịa fee chi a.
DAN 11:39 Ọ ga-emegide ebe niile e wusiri ike, nke siri ike site nʼinyeaka chi nke mba ọzọ. Ndị niile nabatara ya ka ọ ga-eme ka nsọpụrụ bara ụba. Ọ ga-eme ha ndị ọchịchị ọtụtụ mmadụ, kenyekwa ha ala dịka ụgwọ ọrụ ha.
DAN 11:40 “Ma nʼoge ikpeazụ, eze ndịda ga-ebuso ya agha, ma eze nke ugwu ga-eji iwe chịkọta ndị agha na-agba ụgbọ agha, ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ji ụgbọ mmiri megide ya. Ọ ga-ebuso ọtụtụ mba agha, kpochapụ ha dịka idee mmiri si ekpochapụ ihe.
DAN 11:41 Ọ ga-abata na Ala Ọma ahụ, gbukwaa iri puku mmadụ kwuru iri puku mmadụ, ma obodo Edọm, obodo Moab na ndị ndu nke Amọn ga-agbapụ site nʼike ya.
DAN 11:42 Ọ ga-aga ibuso ọtụtụ obodo agha, Ijipt agaghị agbanarị ya.
DAN 11:43 Ọ ga-enwe ikike nʼebe akụ nke ọlaọcha na ọlaedo na ụba niile nke ala Ijipt. Ndị Libịa na ndị Kush ga-edokwa onwe ha nʼokpuru ya.
DAN 11:44 Ma nʼoge a kwa, ozi ga-esi nʼọwụwa anyanwụ na nʼugwu bịa, nke ga-emenye ya egwu. Nʼihi ya, ọ ga-eji oke iwe pụọ ibibi ọtụtụ ndị ma laakwa ha nʼiyi.
DAN 11:45 Ọ ga-akwụba ụlọeze ya nʼetiti ugwu ọma ahụ dị nsọ na nʼoke osimiri, nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, ọ ga-abịaru ọgwụgwụ ya, ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka.
DAN 12:1 “Nʼoge ahụ, Maikel, onyeisi ọchịchị ukwuu ahụ, nke na-eche ndị unu, ga-ebili. Ọ ga-abụ oge nhụju anya, a na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe mba ọbụla malitere ruo ugbu a. Ma mgbe ahụ, ndị gị niile, ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ ahụ, ka a ga-anapụta.
DAN 12:2 Igwe ndị niile nwụrụ anwụ, ndị e likwara, ha ga-ebilite. Ụfọdụ ha ga-ebili baa na ndụ ebighị ebi, ma ụfọdụ ga-ebili keta ihere na ịbụ ọnụ nke ebighị ebi.
DAN 12:3 Ndị ahụ bụ ndị maara ihe, ka a ga-eme ka ha nwuo ọcha dịka ihe mbara eluigwe. Ndị ahụ niile na-emekwa ka ọtụtụ si nʼihe ọjọọ mee ezi omume ga-enwukwa dịka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi.
DAN 12:4 Ma gị bụ Daniel, zoo okwu e dere nʼakwụkwọ a, mechiekwa ma kachiekwa ha akara tutu ruo ọgwụgwụ oge. Ọtụtụ ga-agbagharị ebe na ebe ọzọ, ma ihe ọmụma ga-aba ụba.”
DAN 12:5 Mgbe ahụ, mụ bụ Daniel weliri anya hụ mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ha nọ nʼakụkụ osimiri ahụ, otu nʼakụkụ nke a, otu nʼakụkụ nke ọzọ.
DAN 12:6 Otu nʼime ha juru nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke guzo nʼakụkụ elu elu nke osimiri ahụ ajụjụ, sị, “Olee mgbe ihe ndị a na-eyi egwu ga-emezu?”
DAN 12:7 Nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nọ nʼakụkụ elu elu mmiri nke osimiri ahụ chịlịri aka nri na aka ekpe ya elu. Anụkwara m mgbe o ji Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi, “Nʼihe ndị a ga-emezu naanị mgbe afọ atọ na ọkara gafere, tupu onye ahụ na-emebi ike nke ndị dị nsọ ga-abịa nʼisi ngwụcha ndụ ya, ihe ndị a niile ga-emezucha.”
DAN 12:8 Anụrụ m ma aghọtaghị m, nʼihi nke a, a sịrị m, “Biko, Onyenwe m, gịnị ka ihe ndị a ga-apụta?”
DAN 12:9 Ọ sịrị, “Daniel, gawara onwe gị. Nʼihi na-apịachiela okwu ndị a, kachiekwa ya akara tutu ruo nʼọgwụgwụ oge.
DAN 12:10 Ọtụtụ ka a ga-eme ka ha dị ọcha, sachaa ha mee ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ, a ga-anụchakwa ha. Ma ndị ajọ omume ga-aga nʼihu nʼajọ omume ha. O nweghị onye ajọ omume nke ga-aghọtakwa ihe, ma ndị ahụ maara ihe ga-aghọta ihe ihe a pụtara.
DAN 12:11 “Site nʼoge e mechiri ịchụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị niile ruo nʼoge a ga-ewuli ihe arụ ahụ nke na-eweta mbibi, ga-abụ otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị itoolu. (1,290)
DAN 12:12 Ngọzị ga-adịrị onye ahụ nke na-echere, ma nọgidesịkwa ike ruo mgbe otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị atọ, na iri ụbọchị atọ na ise (1,335) ahụ gafere.
DAN 12:13 “Ma gị onwe, gawara onwe gị ruo ọgwụgwụ ihe ndị a. Ị ga-ezukwa ike, ị ga-ebilitekwa nʼoge ikpeazụ ịnara ihe nketa nke ruuru gị.”
HOS 1:1 Okwu Onyenwe anyị nke bịakwutere Hosiya nwa Beiri nʼoge Uzaya, na Jotam, na Ehaz, na Hezekaya, bụ ndị eze Juda, na nʼoge Jeroboam nwa Jehoash bụ eze nʼIzrel.
HOS 1:2 Na mmalite okwu Onyenwe anyị site nʼọnụ Hosiya, Onyenwe anyị gwara Hosiya sị, “Gaa lụtara onwe gị nwanyị na-akwa iko na ụmụ amụtara nʼịkwa iko, nʼihi na dịka nwanyị alụrụ alụ nʼakwa iko, ala a na-akwa iko nke ukwu site nʼịgbahapụ Onyenwe anyị.”
HOS 1:3 Ya mere, ọ gara lụọ Goma nwa Diblaim, onye tụụrụ ime mụọra ya nwa nwoke.
HOS 1:4 Onyenwe anyị gwara ya, “Aha ị ga-agụ nwantakịrị ahụ bụ Jezril. Nʼihi na tupu nwa oge nta agafee, aga m ata ezinaụlọ Jehu ahụhụ nʼihi ọbara ọ wụsiri na Jezril. Aga m eme ka alaeze nke ụlọ Izrel kwụsị.
HOS 1:5 Nʼụbọchị ahụ, aga m agbaji ụta Izrel na Ndagwurugwu Jezril.”
HOS 1:6 Emesịa, Goma tụụrụ ime ọzọ, mụta nwa nwanyị. Ọ gwara ya, “Aha ị ga-agụ ya bụ Lo-Ruhama, nʼihi na agaghị m enwekwa obi ebere ọzọ nʼahụ ụlọ Izrel, ịgbaghara ha mmehie ha.
HOS 1:7 Ma aga m enwe obi ebere nʼahụ ụlọ Juda. Mụ onwe m ga-azọpụta ha site na Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Agaghị m eji ngwa agha ọbụla, dịka ụta maọbụ mma agha maọbụ ike ibu agha maọbụ ịnyịnya maọbụ ndị na-agba ịnyịnya zọpụta ha.”
HOS 1:8 Mgbe ọ jụrụ Lo-Ruhama ara, ọ tụụrụ ime ọzọ, mụọ nwa nwoke.
HOS 1:9 Onyenwe anyị sịrị, “Kpọọ aha ya Lo-ammi, nke pụtara unu abụghị ndị m, nʼihi na unu abụghị ndị nke m, mụ onwe m abụkwaghị Chineke unu.
HOS 1:10 “Ma ọnụọgụgụ ụmụ Izrel ga-adị ka aja dị nʼọnụ oke osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ tụọ nʼihe ọtụtụ. Nʼebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ nʼebe ahụ ka a ga-anọ sịkwa ha, ‘Ụmụ Chineke dị ndụ ka unu bụ.’
HOS 1:11 A ga-achịkọtakwa ndị Juda na ndị Izrel ọnụ. Ha ga-ahọpụtakwara onwe ha otu onyeisi, si nʼala ahụ rigopụta, nʼihi ihe ukwu ka ụbọchị Jezril ga-abụ.
HOS 2:1 “Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’
HOS 2:2 “Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya, nʼihi na ọ bụghị nwunye m, mụ onwe m abụkwaghị di ya. Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya, ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ.
HOS 2:3 Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.
HOS 2:4 Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m, nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.
HOS 2:5 Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko, ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere. Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya, ndị na-enye m nri na mmiri, ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’
HOS 2:6 Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu; aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje.
HOS 2:7 Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha. Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha. Mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m, nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’
HOS 2:8 Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m, na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv, na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile nke o ji na-efe Baal.
HOS 2:9 “Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara, na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru. Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m, nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.
HOS 2:10 Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya, ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.
HOS 2:11 Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị; ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ, nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.
HOS 2:12 Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi, nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya; aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa, anụ ọhịa ga-eripịa ha.
HOS 2:13 Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile, ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya, pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
HOS 2:14 “Nʼihi nke a, aga m arara ya, duba ya nʼime ọzara, jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ.
HOS 2:15 Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya, gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya. Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa, nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta.
HOS 2:16 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Ị ga-akpọ m ‘Di m,’ ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.
HOS 2:17 Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya, ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ.
HOS 2:18 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ, meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ, na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ. Aga m emebi ngwa agha niile, agha niile ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ.
HOS 2:19 Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi; aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi, nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere.
HOS 2:20 Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị. Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị.
HOS 2:21 “Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “M ga-azaghachi eluigwe, ha ga-azaghachi ala.
HOS 2:22 Ala ga-azaghachi ọka na mmanya ọhụrụ na mmanụ oliv, mgbe ahụ ha ga-azaghachi Jezril.
HOS 2:23 Aga m akụkwa ya nye onwe m nʼala ahụ dịka mkpụrụ. Aga m egosi ịhụnanya m nʼahụ onye ahụ m kpọrọ, ‘Onye m na-ahụghị nʼanya.’ M ga-asịkwa ndị ahụ a kpọrọ, ‘Ndị na-abụghị ndị m,’ ‘Unu bụ ndị nke m,’ Ha ga-azakwa, ‘Chineke m ka ị bụ.’ ”
HOS 3:1 Onyenwe anyị gwara m ọzọ, “Gakwuru nwanyị a na-akwa iko, nke na-emekwa enyi na-ezighị ezi, gosi ya ịhụnanya gị dịka Onyenwe anyị si hụ ndị Izrel nʼanya, nʼagbanyeghị na ha na-eso chi ndị ọzọ na-enwekwa mmasị dị ukwuu nʼachịcha nsọ e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee.”
HOS 3:2 Nʼihi ya, eweere m ego ọlaọcha dị iri na ise, na otu ntụju ọka homa, na ọka balị zụta ya.
HOS 3:3 Mgbe ahụ agwara m ya, “Mụ na gị ga-ebi ọtụtụ ụbọchị, ị gaghị agbakwa akwụna, maọbụ nwee nwoke ọbụla gị na ya ga-enwe mmekọ, otu a ka m ga-emekwa nʼebe ị nọ.”
HOS 3:4 Nke a na-egosi na Izrel ga-anọ ogologo mgbe na-enweghị eze maọbụ onye ọchịchị. Ọ gaghị enwe ịchụ aja maọbụ nkume nsọ maọbụ efọọd maọbụ arụsị ezinaụlọ.
HOS 3:5 Mgbe nke a gasịrị, Izrel ga-alọghachi, chọọ Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid bụ eze ha. Ha ga-ewere ịma jijiji bịakwute Onyenwe anyị, bịaghachitekwa ngọzị ya nʼoge ikpeazụ a.
HOS 4:1 Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo megide unu ndị bi nʼala a. “Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya, ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.
HOS 4:2 Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ, ịgha ụgha na igbu mmadụ, izu ohi na ịkwa iko. Ọgbaaghara dị nʼebe niile, ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.
HOS 4:3 Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ, ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ, ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe, ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.
HOS 4:4 “Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu, ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo. Nʼihi na ndị gị dịka ndị na-eseso onye nchụaja okwu.
HOS 4:5 Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị, ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ. Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi
HOS 4:6 ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe. “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma, aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m; ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.
HOS 4:7 Ka ha na-abawanye nʼọnụọgụgụ, otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m, ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.
HOS 4:8 Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m. Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu.
HOS 4:9 Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa. Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile.
HOS 4:10 “Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha. Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba, nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị, were onwe ha nyefee
HOS 4:11 nʼaka ịgba akwụna, na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ, nke na-ewepụ mmụọ nghọta.
HOS 4:12 Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme, na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase. Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo; ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha.
HOS 4:13 Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile, na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile, na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint, ebe ndo ya dị ezi mma. Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna, ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko.
HOS 4:14 “Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ, mgbe ha na-agba akwụna, maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ mgbe ha na-akwa iko, nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna, ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja, ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi.
HOS 4:15 “Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel, ma ka ikpe gharakwa ịma Juda. “Unu agakwala Gilgal, unu agakwala ruo Bet-Aven, unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’
HOS 4:16 Ndị Izrel dị isiike dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike. Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara?
HOS 4:17 Ifrem na arụsị agbaala ndụ hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya.
HOS 4:18 Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ, ha na-aga nʼihu na-agba akwụna; ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha.
HOS 4:19 Ifufe ga-ebupụ ha, aja ha na-achụ ga-ewetara ha ihere.
HOS 5:1 “Nụrụnụ nke a, unu ndị nchụaja! Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel! Geenụ ntị, unu ndị ezinaụlọ eze. Nʼihi na ọ bụ unu ka ikpe ahụ gbasara. Nʼihi na unu abụrụla ihe ị maa nʼọnya na Mizpa, na ụgbụ agbasara nʼelu Taboa.
HOS 5:2 Ndị nnupu isi ahụ abamiela ime nʼigbu mmadụ, aga m ata ha niile ahụhụ.
HOS 5:3 Amaara m ihe niile gbasara Ifrem, ọ dịkwaghị ihe zoro ezo banyere Izrel nʼebe m nọ. Gị Ifrem, ugbu a ị gbawala akwụna; gị Izrel, emerụọkwala gị.
HOS 5:4 “Omume ha agaghị ekwe ka ha laghachikwute Chineke ha, nʼihi na mmụọ nke ịkwa iko ewerela ute biri nʼime ha, ha amaghịkwa Onyenwe anyị.
HOS 5:5 Mpako niile nke Izrel na-agba ama megide ha, Ọ bụladị Izrel na Ifrem na-asọ ngọngọ nʼime mmehie ha, Juda, nʼonwe ya, soo ha na-asọ ngọngọ.
HOS 5:6 Mgbe ha ga-eji igwe ewu na atụrụ ha na igwe ehi ha, gaa ịchọ Onyenwe anyị, ha agaghị achọta ya. Nʼihi na o sitela nʼebe ha nọ wezuga onwe ya.
HOS 5:7 Ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ha mụrụ ụmụ a kwatara nʼiko. Ugbu a, mmemme ọnwa ọhụrụ ha ga-eripịa ha na ala ubi ha.
HOS 5:8 “Fụọ opi ike na Gibea, fụkwaa mpi anụ na Rema. Tie mkpu agha na Bet-Aven. Lee anya nʼazụ gị, Benjamin.
HOS 5:9 A ga-ebibi Ifrem kpamkpam nʼụbọchị ahụ m ga-ata ha ahụhụ. Nʼetiti ebo nke Izrel niile, ka m na-ekwusa ka amara na ọ bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi.
HOS 5:10 Ndị ndu Juda adịla ka ndị ahụ na-ewezuga oke ala, aga m awụkwasị ha iwe m dịka uju mmiri ozuzo.
HOS 5:11 Ifrem bụ onye a na-emegbu emegbu, onye e ji ike na-azọpịa, nʼihi na ọ kpacha anya na-achụso ihe efu.
HOS 5:12 Adị m ka nla nye Ifrem, dịkwa ka ihe na-eweta ire ure dịịrị ndị Juda.
HOS 5:13 “Mgbe Ifrem hụrụ ụdị ọrịa ọ na-arịa, Juda ahụkwa ọnya dị ya nʼahụ, mgbe ahụ Ifrem gakwuru ndị Asịrịa, ma zigakwara eze ukwu ahụ ozi. Ma ọ pụghị ịgwọ gị, maọbụ gwọọ ọnya gị niile.
HOS 5:14 Nʼihi na-aga m adị ka ọdụm nye Ifrem dịkwa ka nwa ọdụm nye Juda. Aga m adọkasị anụ ahụ ha ma hapụ ha pụọ. Aga m ebupụ ha pụọ, na-enweghị onye ga-abịa ịzọpụta ha.
HOS 5:15 Aga m alaghachi azụ nʼọnọdụ m, ruo mgbe ha kweere na ikpe mara ha, ma chọọ ihu m; nʼọnọdụ mmekpa ahụ ha, ha ga-achọsi m ike.”
HOS 6:1 “Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị. Ya onwe ya adọkaala anyị, ọ ga-agwọkwa anyị; o tipụla anyị ọnya, ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị.
HOS 6:2 Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị, meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.
HOS 6:3 Ka anyị mara Onyenwe anyị; ka anyị gbalịsie ike ịmata ya. Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite, nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ, ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo, dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.”
HOS 6:4 “Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem? Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda? Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ, dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta.
HOS 6:5 Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha. Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha, ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.
HOS 6:6 Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja, ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.
HOS 6:7 Ma dịka Adam, ha emebiela ọgbụgba ndụ m; nʼebe ahụ ka ha nọ gosi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
HOS 6:8 Gilead bụ obodo nke ndị na-eme ajọ ihe, nke eji nzọ ụkwụ ọbara zọtọsịa.
HOS 6:9 Dịka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-ezo na-eche onye ga-agafe, otu a ka ndị nchụaja si egbu ndị mmadụ nʼụzọ Shekem, leenụ oke ajọ omume ihere dị otu a.
HOS 6:10 Nʼezie, ahụla m ihe jọgburu onwe ya nʼime Izrel. Nʼebe ahụ ka Ifrem nọ na-agba akwụna, emerụọkwala Izrel.
HOS 6:11 “Ma nye gị onwe gị, Juda, owuwe ihe ubi nọ na-eche gị. “Mgbe ọbụla m ga-eweghachi akụnụba ndị m,
HOS 7:1 mgbe m chọrọ ịgwọ Izrel, mmehie Ifrem na-apụta ihe, a na-ekpughekwa arụ a na-eme na Sameria. Ha na-aghọ aghụghọ, ndị ohi na-akụwakwa ụlọ ndị mmadụ, ndị na-apụnara mmadụ ihe nọ nʼokporoụzọ.
HOS 7:2 Ọ dịghị onye bi nʼime ha maara na m na-echeta mmehie ha niile. Ugbu a, mmehie ha agbaala ha gburugburu. Ana m ahụkwa ha niile.
HOS 7:3 “Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha; ụmụ eze na-achị ọchị nʼihi ụgha ha.
HOS 7:4 Ha niile bụ ndị na-akwa iko; ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ, nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ, site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri.
HOS 7:5 Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị, ụmụ eze bụ ndị akpalịrị site na-ịṅụbiga mmanya oke, ya na ndị na-akwa emo jikọtara aka.
HOS 7:6 Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha, ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya. Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ, nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ.
HOS 7:7 Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ. Ha na-eripịa ndị eze ha. Ndị eze ha niile na-ada, ma o nweghị onye nʼime ha na-akpọku m.
HOS 7:8 “Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ. Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị.
HOS 7:9 Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha, ma ha adịghị aghọta ya. Isi awọ apụtala ha nʼisi, ma ya onwe ya amaghị na o si otu a dịrị.
HOS 7:10 Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya ma nʼagbanyeghị ihe ndị a ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya, maọbụ chọọ ya.
HOS 7:11 “Ifrem dịka nduru nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie, ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt, ma na-agbakwurukwa Asịrịa.
HOS 7:12 Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha, dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe. Aga m enye ha ahụhụ nʼihi njehie ha niile.
HOS 7:13 Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ha ajụla m. Ha na-ala nʼiyi nʼihi na ha enupula isi ha megide m. Achọrọ m ka m gbapụta ha, ma ha na-agha ụgha megide m.
HOS 7:14 Ha ejighịkwa obi ha akpọku m, kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa. Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya, ha na-egbukasị onwe ha ahụ, na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ.
HOS 7:15 Enyerela m ha aka, mee ka ha dị ike, ma ha atụgharịala gbaa izu imegide m.
HOS 7:16 Ha adịghị ele anya enyemaka nʼaka Onye kachasị ihe niile elu. Ha dịka ụta rọgọrọ arọgọ, nke àkụ ya na-adịghị agbata ihe ọbụla. Ndị ndu ha ga-ada site na mma agha, nʼihi okwu ọjọọ si ha nʼọnụ na-apụta. Nʼihi nke a, a ga-eji ha mee ihe ọchị nʼala Ijipt.
HOS 8:1 “Tinye opi ike nʼọnụ gị! Nʼihi na ugo nʼefefe nʼelu ụlọ Onyenwe anyị, nʼihi na ha emebiela ọgbụgba ndụ m, nupu isi megide iwu m.
HOS 8:2 Ugbu a ndị Izrel na-etiku m mkpu akwa, ‘Chineke anyị, anyị bụ Izrel maara gị.’
HOS 8:3 Ma Izrel ajụla ihe dị mma. Ugbu a, ndị iro ga-achụ ya ọsọ.
HOS 8:4 Ha meere onwe ha ndị eze, ma ha ajụtaghị m ase; ha na-achọrọkwa ndị ọchịchị, ma ghara ịjụta ase nʼaka m. Ọlaọcha na ọlaedo ha ka ha ji na-akpụrụ onwe ha arụsị, nke ha ji ebibi onwe ha.
HOS 8:5 Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria. Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha. Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha?
HOS 8:6 Ọ bụ nʼIzrel ka ha si. Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya; ọ bụghị Chineke. A ga-akụrisikwa nwa ehi Sameria ahụ.
HOS 8:7 “Ha akụọla ifufe, ha ga-aghọtakwa oke ifufe. Osisi ọka ha na-eguzo na-enweghị okpo ọka ọbụla. A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ, ndị mba ọzọ ga-atapịa ya.
HOS 8:8 Elodala Izrel! Lee, ha nọ ugbu a nʼetiti ndị mba ọzọ dịka mkpọkọrọ ite.
HOS 8:9 Nʼihi na ha ejeela Asịrịa dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya. Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya.
HOS 8:10 Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche, aga m achịkọta ha. Ha ga-atakwa ahụ nʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha.
HOS 8:11 “Nʼihi na Ifrem ewuola ọtụtụ ebe nchụaja maka ịchụ aja mmehie, ebe nchụaja ndị a abụrụla ebe a na-eme mmehie.
HOS 8:12 E depụtaara m ha ọtụtụ ihe banyere iwu m, ma ha were ya dịka ihe e si na mba ọzọ webata.
HOS 8:13 Ha na-achụ aja dịka onyinye nye m, ha na-erikwa anụ ndị ahụ ha jiri chụọ aja, ma na Onyenwe anyị enweghị mmasị nʼebe aja ha dị. Ugbu a, ọ ga-echeta ajọ omume ha, nye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie niile ha, ha ga-alaghachi nʼIjipt.
HOS 8:14 Izrel echezọọla Onye kere ha ma wukwaa obi ndị eze dị iche iche. Juda ewukwaala obodo dị iche iche e wusiri ike. Nʼihi ya, aga m ezite ọkụ nʼobodo ha niile, ọkụ ga-erepịa obodo ha niile e wusiri ike.”
HOS 9:1 Aṅụrịla ọṅụ, gị Izrel, ka obi ghara ịtọkwa gị ụtọ dịka ọ na-atọ ndị mba ọzọ, nʼihi na ị jụla Chineke gị, bido ịgba akwụna i hụrụ ụgwọ ọrụ ịkwa iko nʼanya nʼelu ebe ịzọcha ọka niile.
HOS 9:2 Ebe ịzọcha mkpụrụ ọka na ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị agaghị azụ ha nri, mmanya ọhụrụ ga-agharịpụ ha.
HOS 9:3 Ha agaghị anọgidekwa nʼala Onyenwe anyị, ma Ifrem ga-alaghachi nʼala Ijipt nọdụ nʼAsịrịa rie nri rụrụ arụ.
HOS 9:4 Ha agaghị awụsa ihe ọṅụṅụ dịka aja nye Onyenwe anyị, nʼihi na ọdịghị aja ha ga-achụ ga-atọ ya ụtọ. Aja ndị a ga-adị ha ka nri nke ndị na-eru ụjụ si dị. Onye ọbụla riri nri ndị a ga-abụ onye na-adịghị ọcha. Nri ndị a ga-adịrị naanị ha onwe ha, ha agaghị ewebata ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
HOS 9:5 Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka, ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị?
HOS 9:6 A sịkwa na ha agbanarị mbibi, ndị Ijipt ga-achịkọta ha. Ndị Memfis ga-elikwa ha. Akụnụba nke ọlaọcha ha ka uke ga-ewekọrọ, ogwu na uke ga-etokwa nʼime ebe obibi ha niile,
HOS 9:7 Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ na-abịa, Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso. Ka Izrel mara nke a. Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu, nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala, unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu, na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara.
HOS 9:8 Ma onye amụma bụ onye nche Chineke, na-eche Ifrem nche, ma igbudu nke ọnya jupụtara nʼụzọ ya niile, ịkpọ asị dịkwa nʼime nʼụlọnsọ Chineke ya.
HOS 9:9 Ha emerụọla onwe ha ebe ọ dị ukwuu, dịka ọ dị nʼụbọchị Gibea. Ọ ga-echeta njehie ha. Ọ ga-enye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie ha niile.
HOS 9:10 “Mgbe m chọtara Izrel, ọ dị ka m chọtara mkpụrụ grepu nʼọzara; mgbe m hụrụ nna nna unu ha, ọ dị ka ihu mkpụrụ bụ ụzọ chaa nʼelu osisi fiig. Ma mgbe ha bịaruru na Baal-Peoa, ha doro onwe ha nsọ nyefee nʼaka arụsị ahụ na-eweta ihere, si otu a ghọọ ndị rụrụ arụ, dịka ihe ndị ahụ ha hụrụ nʼanya si bụrụ ihe rụrụ arụ.
HOS 9:11 Nsọpụrụ Ifrem nwere ga-efefu dị ka nnụnụ, nʼihi na ọmụmụ nwa agaghị adị, a gaghị atụkwa ime, agaghị adịkwa ime.
HOS 9:12 A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha, aghaghị m ime ka ha nwụọ. Ahụhụ ga-adịrị ha, mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m.
HOS 9:13 Ahụla m na Ifrem yiri Taịa, bụ ihe akụnyere nʼala mara mma. Ma Ifrem ga-eji aka ya kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.”
HOS 9:14 Biko, Onyenwe anyị nye ha. Gịnị ka i kwesiri inye ha? Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya, na ara nke mmiri ara na-adịghị.
HOS 9:15 “Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal, akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ. Nʼihi omume mmehie ha niile, aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha. Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ, ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi.
HOS 9:16 Etigbuola Ifrem, mgbọrọgwụ ha akpọnwụọla, ha agaghị amịkwa mkpụrụ. A sịkwarị na ha amụọ ụmụ, aga m egbu ụmụ ha niile, ndị ha hụrụ nʼanya.”
HOS 9:17 Chineke m ga-ajụ ha, nʼihi na ha adịghị ege ya ntị maọbụ rube isi. Ha ga-aghọ ndị na-awagharị awagharị na-enweghị ụlọ, nʼetiti mba niile.
HOS 10:1 Izrel bụ osisi vaịnị dị mma, nke na-amịta mkpụrụ nke ukwuu. Dịka mkpụrụ ya na-aba ụba, otu a ka o si amụba ebe ịchụ aja ya. Dịka ala ya na-abawanyekwa ụba otu a ka o si edoziri onwe ya nkume dị nsọ.
HOS 10:2 Obi ha dị aghụghọ, ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha. Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha, ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile.
HOS 10:3 Ma ugbu a, ha ga-asị, “Anyị enweghị eze, nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu, ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?”
HOS 10:4 Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru, were ịṅụ iyi na-agbakwa ndụ, ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile, dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi.
HOS 10:5 Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven. Ndị ya ga-eruru ya ụjụ, otu a kwa ka ndị nchụaja ya rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ, maka ebube nke a napụrụ ya.
HOS 10:6 Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa, dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ. A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu, Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ.
HOS 10:7 A ga-ala eze Sameria nʼiyi dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile,
HOS 10:8 a ga-ebibicha ebe niile dị elu nke ihe ọjọọ, bụ Aven, ọ bụ ya bụ mmehie ndị Izrel, ogwu na uke ga-etolitekwa, nʼebe nchụaja ha. Mgbe ahụ ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Kpuchite anyị!” Sịkwa ugwu nta niile, “Dakwasị anyị!”
HOS 10:9 “Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie, i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị. Ọ bụ na agha agaghị eri ha bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea?
HOS 10:10 Aga m abịa buso ndị mmehie a agha, nye ya ahụhụ; mba ndị ọzọ ga-ebilite megide ha, taa ha ahụhụ nʼihi ajọ omume abụọ ha.
HOS 10:11 Ifrem bụ nne ehi a zụrụ azụ nke hụrụ ịzọcha ọka nʼanya, nʼihi ya, M ga-ekonye ịyagba nʼolu nʼolu ọma ya ahụ. Aga m agba Ifrem dịka ịnyịnya, Juda aghaghị ịkọ ala ubi Jekọb ga-akọze ala nye onwe ya.
HOS 10:12 Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu, unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya. Kọgharịakwanụ obi unu siri ike, nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ bịara wụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume.
HOS 10:13 Ma unu akụọla mkpụrụ ajọ omume; unu aghọtakwala ihe ọjọọ dịka ihe ubi. Unu eriela mkpụrụ osisi ụgha. Nʼihi na unu atụkwasịla obi unu nʼịdị ike nke onwe unu, na nʼịdị ọtụtụ nke ndị bụ dike nʼagha unu.
HOS 10:14 Nʼihi ya, ụzụ nke ibu agha aghaghị ibili nʼetiti unu, ebe unu niile e wusiri ike ga-ada. Ọ ga-ada dịka Shalman si bibie Bet Abel nʼụbọchị agha, mgbe a tụpịara ndị bụ nne na ụmụ ha.
HOS 10:15 Ọ bụ ihe dị otu a ga-adakwasị gị, Betel, nʼihi na ajọ omume gị dị ukwuu. Mgbe chi ụbọchị ahụ bọrọ, a ga-ala eze Izrel nʼiyi kpamkpam.
HOS 11:1 “Mgbe Izrel bụ nwantakịrị, ahụrụ m ya nʼanya, ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.
HOS 11:2 Ma dịka m na-akpọ ha, otu a ka ha na-aga nʼebe dị anya site nʼebe m nọ. Ha chụrụ Baal aja, surekwa aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị dị iche iche.
HOS 11:3 Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije, ejidere m ha nʼaka m abụọ, ma ha amaghị na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya.
HOS 11:4 Eji m ụdọ nke mmadụ bụ ebere, na ịhụnanya duo ya. Adịrị m ha dịka onye nʼebuli ibu arọ site nʼolu ha, ehulatakwara m ala, were aka m tinye ha nri nʼọnụ.
HOS 11:5 “Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt, Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha, nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m?
HOS 11:6 Mma agha ga-efegharị nʼobodo ha niile, ọ ga-eripịa ndị nchụaja na-agba afa, ọ ga-eripịakwa nzube ọjọọ ha niile.
HOS 11:7 Ndị m ekpebiela nʼobi ha ịhapụ m. Nʼagbanyeghị na ha na-akpọ m Chineke nke kachasị ihe niile elu, ma mụ onwe m agaghị ebuli ha elu nʼụzọ ọbụla.
HOS 11:8 “M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem? M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel? M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma? M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim? Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m; ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka.
HOS 11:9 Agaghị m emezu iwe ọkụ m maọbụ bibiekwa Ifrem ọzọ. Nʼihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ. Abụ m Onye Nsọ na-ebi nʼetiti unu. Agaghị m emegidekwa obodo ha.
HOS 11:10 Nʼihi na ha ga-agbaso Onyenwe anyị. Ọ ga-agbọkwa ụja dịka ọdụm. Mgbe ọ gbọrọ ụja, ụmụ ya ga-eji ịma jijiji site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bịakwute ya.
HOS 11:11 Dịka igwe nnụnụ ka ha ga-ama jijiji bịa site nʼIjipt, dịka nduru ka ha ga-efelata site nʼAsịrịa. Aga m eme ka ha biri nʼụlọ ha ọzọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
HOS 11:12 Ifrem e jirila okwu ụgha gbaa m gburugburu, ezinaụlọ Izrel e jirila aghụghọ na-emeso m omume, ma Juda nọsịrị ike nʼekweghị nchịkọta nʼebe Chineke nọ, ọbụladị megide Onye Nsọ ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi.
HOS 12:1 Akaọrụ Ifrem bụ naanị ịchụso ikuku, ọ na-achụso ikuku si nʼọwụwa anyanwụ bido nʼụtụtụ ruo nʼabalị. Otu a ka ha si eme ka ịgha ụgha, na ime ihe ike na-abawanye ụba. Ha na Asịrịa na-agbakwa ndụ, ha na-ebugakwa mmanụ nʼIjipt.
HOS 12:2 Onyenwe anyị na-akpọ Juda ikpe. Ọ ga-ata Jekọb ahụhụ dịka ụzọ ya si dị, kwụghachikwa ya dịka omume ya si dị.
HOS 12:3 Mgbe ọ nọ nʼafọ nne ya ka o jidere nwanne ya nwoke nʼikiri ụkwụ. Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ya na Chineke gbara mgba.
HOS 12:4 E, ya na mmụọ ozi gbara mgba. Nʼoge ahụ, o jidesiri ya aka ike, kwaa akwa, rịọọ ngọzị site nʼaka ya. Ọ hụrụ ya na Betel, gwaakwa ya okwu,
HOS 12:5 Onyenwe anyị Chineke onye pụrụ ime ihe niile, Onyenwe anyị bụ aha ya.
HOS 12:6 Ịghaghị ịlọghachikwute Chineke gị, guzosie ike nʼịhụnanya na ikpe ziri ezi, na-elekwa anya Chineke gị mgbe niile.
HOS 12:7 Onye ahịa na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ na-erenye ndị mmadụ ahịa, ọ hụrụ imegbu emegbu nʼanya.
HOS 12:8 Ifrem kwuru, “Abaala m ọgaranya! Abụrụla m onye nwere akụnụba dị ukwuu! Ọ bụ ezie na m bụ onye nwere akụ dị ukwuu, ma agaghị achọta njehie maọbụ mmehie ọbụla nʼime m.”
HOS 12:9 “Abụ m Onyenwe anyị na Chineke gị, onye si nʼIjipt kpọpụta unu. Aga m emekwa ka ị biri nʼụlọ ikwu ọzọ, dịka ọ dị nʼoge mmemme ndị ahụ niile a kara aka.
HOS 12:10 A gwara m ndị amụma, ọ bụ m mere ka ha hụ ọhụ dị iche iche, sitekwa nʼọnụ ndị amụma tụọ ilu dị iche iche.”
HOS 12:11 Gilead ọ na-eme ajọ ihe? Ndị ya bụ ndị efulefu. Ha na-achụ aja oke ehi dị iche iche na Gilgal? Ebe ịchụ aja ha niile ga a dịka ebe a chịkọtara ukwu nkume, nke dị nʼubi a kọrọ akọ.
HOS 12:12 Jekọb gbalagara nʼala Aram; Izrel fere ofufe nʼihi inweta nwunye, nʼihi ịkwụ ụgwọ ya, o lekọtara atụrụ.
HOS 12:13 Ọ bụkwa onye amụma ka Onyenwe anyị ji site nʼIjipt kpọpụta Izrel, o sitekwara nʼaka onye amụma lekọtazie ya anya.
HOS 12:14 Ma Ifrem akpasuola iwe ilu nke ukwuu. Onyenwe ya ga-awụkwasịkwa ya ikpe ọmụma. Ọ ga-akwụghachi ya dịka nlelị ya si dị.
HOS 13:1 Na mbụ, mgbe ọbụla Ifrem kwuru okwu, a na-enwe ọma jijiji, nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nʼIzrel. Ma ikpe maara ya nʼihi ofufe o fere Baal, ọ nwụkwara.
HOS 13:2 Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie, ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche, nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma, ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka. Ha onwe ha na-ekwu, “Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ. Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ”
HOS 13:3 Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ, maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa, dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka, dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ.
HOS 13:4 “Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị, siterịị nʼala Ijipt. Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m. Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m.
HOS 13:5 Elekọtara m unu nʼime ọzara, nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị.
HOS 13:6 Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ. Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga, chefuo m.
HOS 13:7 Nʼihi ya, aghaghị m ịbịakwasị ha dịka ọdụm; maọbụ dịka agụ nke na-ezo onwe ya nʼakụkụ ụzọ.
HOS 13:8 Aga m adakwasị ha dịka anụ ọhịa bịa nke a gbabara aka ụmụ ya, dọwasịa anụ ahụ kpuchiri obi ha aga m eripịa ha dịka ọdụm, anụ ọhịa ga-adọkasịkwa ha.
HOS 13:9 “Aga m ala gị nʼiyi, gị Izrel, onye pụrụ inyere gị aka?
HOS 13:10 Ebee ka ndị eze gị nọ, ka ha bịa zọpụta gị? Ebee ka ndịisi ọchịchị nke obodo gị niile nọ, bụ ndị ahụ i ji nʼihi ha na-asị, ‘Nye m eze na ndị ọchịchị’?
HOS 13:11 Esitere m nʼiwe m nye gị eze, sitekwa nʼọnụma m, napụ gị ya.
HOS 13:12 Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe; a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ.
HOS 13:13 Ihe mgbu nke dịka ihe mgbu nwanyị ime na-eme na-abịakwasị ya; maọbụ nwantakịrị na-enweghị uche. Mgbe oge ya zuru, ọ jụrụ ịpụta site nʼọnụ akpanwa ka a mụpụta ya.
HOS 13:14 “Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ. Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ. Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị? Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị? “Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla,
HOS 13:15 ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ onye na-amị mkpụrụ nʼetiti ụmụnne ya niile. Ma oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke Onyenwe anyị zitere, ga-esi nʼọzara fekwasị ya. Isi iyi niile ga-ata, olulu mmiri ya ga-atakọrọkwa. A ga-apụnara ya ihe dị nʼụlọakụ ya niile, na akụ niile o nwere.
HOS 13:16 Sameria aghaghị ịta ahụhụ ikpe ọmụma ya, nʼihi na o nupuru isi megide Chineke ha. A ga-eji mma agha gbuo ndị ya niile, tụpịa ụmụntakịrị ya niile nʼala, jirikwa mma agha bọwaa ndị inyom niile dị ime.”
HOS 14:1 Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel; nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ.
HOS 14:2 Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu lọghachikwute Onyenwe anyị. Gwanụ ya sị, “Gbaghara mmehie anyị niile, jirikwa ihuọma nabata anyị, ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja.
HOS 14:3 Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị, ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị. Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’ nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa, nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.”
HOS 14:4 “Aga m agwọ ndaghachi azụ ha, jiri obi m niile hụ ha nʼanya, nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa.
HOS 14:5 Aga m adịrị Izrel dịka igirigi. Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili. Dịka osisi sida nke Lebanọn, mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala;
HOS 14:6 ome ya ga-awasa, ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv, isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn.
HOS 14:7 Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m. Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ. Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị, a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn.
HOS 14:8 Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ? Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya. Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ. Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.”
HOS 14:9 Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a. Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara. Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ. Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha, ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.
JOE 1:1 Okwu Onyenwe anyị nke bịakwutere Juel nwa Petuel.
JOE 1:2 Nụrụnụ nke a, unu ndị okenye; geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼala a. Ihe dị otu a o meela na ndụ unu, ka o mere na ndụ nna nna unu ha?
JOE 1:3 Gwanụ ya ụmụ unu, ka ụmụ unu gwakwa ụmụ ha, ka ụmụ ha gwakwa ụmụ ụmụ ha, ka ụmụ ụmụ ha gwakwa ọgbọ nke na-eso ha.
JOE 1:4 Ihe igurube rifọrọ ka igurube ukwu richara, ihe igurube ukwu rifọrọ, ka ụmụ igurube richara, ihe ụmụ igurube rifọrọ ka igurube ndị ọzọ richapụrụ.
JOE 1:5 Tetanụ, unu ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Kwaanụ akwa. Kwaanụ akwa unu ndị na-aṅụ mmanya; kwaanụ akwa nʼihi mmanya ọhụrụ, nʼihi na e sitela nʼọnụ unu napụ unu mmanya unu na-aṅụ.
JOE 1:6 O nwere mba bịakwasịrị ala m, usuu ndị agha nke na-enweghị ịgụta ọnụ; nke nwere eze dịka ọdụm, nweekwa ikiri eze dịka ka nne ọdụm.
JOE 1:7 Ọ laala mkpụrụ vaịnị m nʼiyi mee ka osisi fiig m niile mebie kpamkpam. O kpechapụsịala agbụgbọ osisi fiig m, kpofuo ha, hapụ alaka osisi ya ka ọ na-acha ọcha.
JOE 1:8 Kwaa akwa mwute dịka nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke di na-aga ịlụ ya nwụrụ.
JOE 1:9 Akwụsịla iwebata onyinye ọka na onyinye mmanya nʼụlọ Onyenwe anyị. Ndị nchụaja na-eru ụjụ, bụ ndị ahụ na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.
JOE 1:10 Emebiela ala ubi niile, ala nọ na-eru ụjụ. Ebibiela ọka niile, mmanya adịghịkwa, otu a kwa, mmanụ oliv adịghịkwa.
JOE 1:11 Daanụ mba nʼobi unu, unu ndị ọrụ ubi, tienụ mkpu akwa, unu ndị ọrụ ubi vaịnị. Tienụ aka nʼobi nʼihi ọka wiiti na ọka balị, nʼihi na a laala owuwe ihe ubi nʼiyi.
JOE 1:12 Osisi vaịnị anwụọla. Osisi fiig akpọnwụọla. Osisi pomegranet na osisi nkwụ, na osisi apụl akpọnwụọla. Nʼezie, osisi niile akpọnwụọla. Nʼebe ndị mmadụ nọ, ọṅụ alala.
JOE 1:13 Yikwasịnụ onwe unu akwa mkpe, unu ndị nchụaja; ruonụ ụjụ, kwaanụ akwa, unu ndị na-eje ozi nʼebe ịchụ aja. Bịanụ, yiri akwa mkpe nọ ọnọdụ abalị unu ndị na-ejere Chineke m ozi nʼihi na egbochiela onyinye ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ ịbata nʼụlọ Chineke unu.
JOE 1:14 Kpọsaanụ obubu ọnụ dị nsọ. Kpọọnụ nzukọta dị nsọ. Chịkọtaanụ ndị okenye na ndị niile bi nʼala a, ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke unu; ka ha tikuo Onyenwe anyị mkpu akwa.
JOE 1:15 Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ bụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị abịala nso. Ọ ga-ewetakwa mbibi site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
JOE 1:16 Ọ bụ na e sitebeghị nʼihu anyị wezuga ihe oriri niile, Ọ bụ na ọṅụ na obi ụtọ e sitebeghị nʼụlọnsọ Chineke anyị pụọ?
JOE 1:17 Mkpụrụ ubi akpọnwụọla nʼọkpụrụkpụ aja ala. Ụlọ a na-edebe ihe oriri atọgbọrọla nʼefu, a kwatuola ọba niile, nʼihi na mkpụrụ ọka niile akpọọla nku.
JOE 1:18 Lee otu anụ ụlọ niile si eze ume! Igwe ehi na-awagharị nʼihi na ha enweghị ebe ịta nri; ọ bụladị igwe atụrụ nọkwa nʼọnọdụ ịta ahụhụ.
JOE 1:19 Gị Onyenwe anyị, ka m na-akpọku, nʼihi na ọkụ erepịala ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ. Ọkụ erechapụkwala osisi niile dị nʼọhịa.
JOE 1:20 Ọ bụladị ụmụ anụ ọhịa na-ebeku gị akwa, nʼihi na iyi niile ataala, ọkụ erechapụkwala ebe ịta nri nke anụmanụ niile nke dị nʼọzara.
JOE 2:1 Fụọ opi ịdọ aka na ntị na Zayọn. Ka a nụ ụda opi ịdọ aka na ntị site nʼelu ugwu nsọ m. Ka ndị niile bi nʼala ahụ maa jijiji, nʼihi na ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị na-abịa, ọ na-abịaru nso.
JOE 2:2 Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na nke mgbarụ ihu. Ọ bụ ụbọchị itiri ojii nke oke ọchịchịrị. Usuu ndị agha dị ike nke ga-ekpuchi elu ugwu niile dịka chi ọbụbọ. Ha hiri nne, nweekwa ike dị ukwuu. Ahụbeghị ụdị dịka ha na mbụ, a gaghị ahụkwa ụdị ha ọzọ ruo ọgbọ niile nke na-abịa.
JOE 2:3 Ọkụ na-ere na-aga ha nʼihu, ire ọkụ na-enwu oke onwunwu dị ha nʼazụ. Tupu ha abịaruo, ala ahụ na-ama mma dịka ogige nke Iden, ma nʼazụ ha, ala ubi niile dịka ọzara nke tọgbọrọ nʼefu, o nweghị ihe ga-agbanarị ịla nʼiyi ha.
JOE 2:4 Nʼile anya, ha dịka ịnyịnya, ha na-ekwogharị dịka ịnyịnya agha.
JOE 2:5 Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala na-arịgo elu ugwu. Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ. Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha.
JOE 2:6 Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu. Ihu ha na-agbarụkwa.
JOE 2:7 Ha na-ekwogharị dịka ndị agha; ha na-arịgo mgbidi dịka ezi ndị agha. Ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị, na-ahapụghị onye ọbụla nʼije ha.
JOE 2:8 Ọ dịghị onye na-anọchiri ibe ya ụzọ. Onye ọbụla na-aga nʼihu nʼahịrị nʼahịrị. Ọ dịghị ngwa agha ọbụla pụrụ ịkwụsị ha, ka ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị.
JOE 2:9 Ha na-enukwasị obodo, na-agbagharị nʼelu mgbidi, na-arịgo, na-abakwa nʼime ụlọ; na-abanye dịka ndị ohi site na oghereikuku niile.
JOE 2:10 Ala na-ama jijiji nʼihu ha, eluigwe na-emekwa mkpọtụ. Ihu anyanwụ na ihu ọnwa na-agbakwa ọchịchịrị, kpakpando adịghịkwa enye ìhè.
JOE 2:11 Olu Onyenwe anyị dara nʼihu ndị agha, ndị agha ya dị agụtaghị ọnụ, ha dịkwa ọtụtụ bụ ndị na-edebe iwu ya. Ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị dị ukwu bụrụkwa ihe dị egwu. Onye pụrụ ịnagide ya?
JOE 2:12 “Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m. Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.”
JOE 2:13 Dọwakwaanụ obi unu, ọ bụghị uwe unu. Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere. Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya. Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ.
JOE 2:14 Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya, hapụrụ anyị ngọzị ya, kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu.
JOE 2:15 Fụọ opi ike nʼime Zayọn. Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ. Kpọkọta nzukọ dị nsọ.
JOE 2:16 Chịkọtaa onye ọbụla, doo nzukọ ahụ nsọ, ma ndị okenye, ma ụmụntakịrị, ma ụmụ na-aṅụ ara. Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya, ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya.
JOE 2:17 Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ”
JOE 2:18 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kworo ekworo nʼihi ala ya, nwee ọmịiko nʼebe ndị ya nọ.
JOE 2:19 Onyenwe anyị zaghachiri ha sị, “Ana m ezitere unu ọka na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, nke ga-ezuru unu, jukwa unu afọ. Agaghị m emekwa ka unu bụrụ ihe ịkwa emo nʼetiti ndị mba ọzọ.
JOE 2:20 “Aga m ewezuga ndị agha ahụ si nʼugwu, zipụ ha nʼebe tere anya, m ga-achụba ha nʼala kpọrọ nkụ, na ebe tọgbọrọ nʼefu. Ndị nọ nʼihu ga-erugbu nʼosimiri Nnu dị nʼọwụwa anyanwụ; ndị nọ nʼazụ ka m ga-erugbu nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ. Isisi ọjọọ ya ga-esipụta, isisi nke ure ya ga-arịgokwa.” Nʼezie, ọ meela ihe ndị dị ukwuu dị iche iche.
JOE 2:21 Atụkwala egwu, gị ala Juda, kama ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ, nʼezie, Onyenwe anyị arụọla ọrụ dị ịtụnanya.
JOE 2:22 Atụla egwu, unu anụ ọhịa niile, nʼihi na ebe ịta nri unu ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ. Osisi na-amị mkpụrụ ha, osisi fiig, na osisi vaịnị na-amịkwa mkpụrụ nʼuju.
JOE 2:23 Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ, ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị, nʼihi ịdị mma ya. Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo, nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ.
JOE 2:24 Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka, ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ.
JOE 2:25 “Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri, ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta, na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri, bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu.
JOE 2:26 Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ, unu ga-etokwa Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m.
JOE 2:27 Mgbe ahụ unu ga-amata na m nọ nʼebe a nʼetiti ndị m Izrel. Unu ga-amatakwa na naanị m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, na ọ dịkwaghị onye ọzọ. Ihere agaghị emekwa ndị m ọzọ.
JOE 2:28 “Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ.
JOE 2:29 Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị.
JOE 2:30 Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe, na nʼelu ụwa; a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ.
JOE 2:31 Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu.
JOE 2:32 Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị ka a ga-azọpụta. Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalem ka mgbapụta ga-adị, dịka Onyenwe anyị kwuru ya. Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị na-akpọ.
JOE 3:1 “Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ, mgbe m ga-eweghachi akụnụba nke Juda na Jerusalem,
JOE 3:2 na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa, mee ka ha zukọọ na Ndagwurugwu Jehoshafat. Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe, nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m Izrel. Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile, kee ala m nʼetiti onwe ha.
JOE 3:3 Ha fere nza nʼihi ndị m, were ụmụ m ndị nwoke gbanwere ụmụ akwụna. Ha rere ụmụ m ndị nwanyị nʼihi mmanya, nʼihi inweta mmanya ha ga-aṅụ.
JOE 3:4 “Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere.
JOE 3:5 Nʼihi na unu weere ọlaọcha m na ọlaedo m, burukwa ihe dị oke ọnụahịa niile m nwere, bulaa ha nʼụlọnsọ chi unu.
JOE 3:6 Unu refuru ndị Juda na ndị Jerusalem, resi ha ndị Griik, si otu a wega ha nʼebe dị anya site nʼala ha.
JOE 3:7 “Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi.
JOE 3:8 Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya.
JOE 3:9 Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile: Jikerenụ agha! Kpọteenụ ndị dike nʼagha. Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha.
JOE 3:10 Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha, kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe. Ka onye na-adịghị ike kwuo sị, “Adị m ike!”
JOE 3:11 Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile. Zukọtaanụ nʼebe ahụ. Kpọdata ndị agha gị dị ike Onyenwe anyị!
JOE 3:12 “Ka akpọlitekwa mba niile, mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe.
JOE 3:13 Tinye mma iwe ihe ubi, nʼihi na mkpụrụ ubi achaala. Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị, nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula, ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke, nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.”
JOE 3:14 Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ! Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ.
JOE 3:15 Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji, kpakpando agakwaghị enye ìhè.
JOE 3:16 Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn, olu ya ga-ada nʼime Jerusalem. Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba. Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike.
JOE 3:17 “Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ. Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ. Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ.
JOE 3:18 “Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị, mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile; mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru. Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta dee Ndagwurugwu Shitim.
JOE 3:19 Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu, Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda, bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha.
JOE 3:20 Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile.
JOE 3:21 Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha? Mba, agaghị m agụnye onye ikpe maara dịka onye ikpe na-amaghị.
AMO 1:1 Okwu ndị Emọs kwuru, onye bụ otu nʼime ndị ọzụzụ atụrụ nke obodo Tekoa. Ndị a bụ ọhụ ọ hụrụ banyere Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a mgbe Uzaya bụ eze ndị Juda. Nʼoge ahụ kwa ka Jeroboam nwa Joash na-achị Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a afọ abụọ tupu oke ala ọma jijiji ahụ adịrị.
AMO 1:2 Ọ sịrị, Onyenwe anyị si nʼugwu Zayọn na-ebigbọ, o si na Jerusalem na-eme ka olu ya daa ụda. Ebe ịta nri nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru ụjụ. Elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa.
AMO 1:3 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Damaskọs, na nʼihi njehie ha nke ugboro anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha azọpịala ndị m nʼime Gilead, ha ji igwe ịzọcha mkpụrụ ọka nwere eze.
AMO 1:4 Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael; ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad.
AMO 1:5 Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs, aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven, na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden. Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.” Ka Onyenwe anyị kwuru.
AMO 1:6 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Gaza, e, nʼihi njehie nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ, nʼihi na ha dọtara mmadụ niile nʼagha, ranye nʼaka ndị Edọm.
AMO 1:7 Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Gaza, ebe ya niile e wusiri ike ga-agba ọkụ.
AMO 1:8 Aga m egbu ndị Ashdọd, ma bibiekwa onye ahụ na-achị Ashkelọn. Aga eweli aka m megide ndị Ekrọn, ruo mgbe ndị Filistia fọdụrụ ga-ala nʼiyi.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị.
AMO 1:9 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Taịa, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha dọkpụrụ ọgbakọ ndị mmadụ renye nʼaka Edọm dịka ohu, ma chefuo ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne dị nʼetiti ha.
AMO 1:10 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Taịa; ọ ga-eredakwa ebe ha niile e wusiri ike.”
AMO 1:11 Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Edọm, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ, o meghị ebere, kama, o mere ka iwe ya dịgidesie ike; nrubiga oke nke ọnụma ya akwụsịkwaghị akwụsị.
AMO 1:12 Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na Teman; ọ ga-erekwa nʼebe niile e wusiri ike nke Bozra.”
AMO 1:13 Ma otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Amọn, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ, nʼihi na ha were mma agha ha bọwaa afọ ụmụ nwanyị Gilead dị ime, nʼihi ime ka oke ala ha saa mbara.
AMO 1:14 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Raba. Ọ ga-erepịakwa ebe ya niile e wusiri ike. Oke ụzụ agha nke ga-ada dịka ụzụ oke ifufe, na ụzụ egbe eluigwe ga na-ada nʼụbọchị ahụ.
AMO 1:15 Eze ha na ndịisi ọchịchị ya ga-abụ ndị a dọtara nʼagha, ndị ga-aga biri nʼala ọzọ.” Ka Onyenwe anyị sịrị.
AMO 2:1 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Moab, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ, mee ha ka ha ghọọ ntụ.
AMO 2:2 Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab, nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt. Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara, nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike.
AMO 2:3 Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi, gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.” Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.
AMO 2:4 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Juda, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị. Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya. Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie, bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro.
AMO 2:5 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda, ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.”
AMO 2:6 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Izrel, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha, reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ.
AMO 2:7 Ha na-azọpịa isi ndị ike na-adịghị, na-echi ha ọnụ nʼaja, na-ewezuga ndị dị umeala nʼụzọ ezi ihe. Nwoke na nna ya na-edinakwuru otu nwaagbọghọ, si otu a merụọ aha nsọ m.
AMO 2:8 Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla, nʼelu uwe ndị anatara na mbe. Nʼime ụlọnsọ chi ha, ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra.
AMO 2:9 “Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha, ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida, ndị sikwara ike dịka osisi ook. Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu, na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi.
AMO 2:10 Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu, duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ, ime ka unu nweta ala ndị Amọrait.
AMO 2:11 “Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma, họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait. Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya.
AMO 2:12 “Ma unu mere ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya. Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma.
AMO 2:13 “Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu, dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada.
AMO 2:14 Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ, ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume, ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha.
AMO 2:15 Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla, ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ. Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya.
AMO 2:16 Ndị obi siri ike nʼetiti ndị dike unu, ga-agbara ọtọ gbapụ ọsọ nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
AMO 3:1 Nụrụnụ okwu ndị a nke Onyenwe anyị kwuru megide unu, unu ndị Izrel, megidekwa ezinaụlọ ahụ niile nke m kpọpụtara site nʼala Ijipt.
AMO 3:2 “Naanị unu ka m họọrọ nʼime ezinaụlọ niile nke nọ nʼelu ụwa; Ọ bụ nʼihi nke a ka m ga-eji nye unu ahụhụ nʼihi mmehie unu niile.”
AMO 3:3 Mmadụ abụọ ga-esi aṅaa jekọọ ije ma ọ bụrụ na ha enweghị nkwekọrịta?
AMO 3:4 Ọdụm ọ na-agbọ ụja nʼọhịa ma ọ bụrụ na o nweghị anụ ọ hụrụ? Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ nʼime olulu ya, mgbe ọ dịghị anụ ọ dọgburu?
AMO 3:5 Nnụnụ ọ na-ama nʼọnya dị nʼala ma ọ bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya? Ọnya e siiri anụ ọ na-akụchi ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara?
AMO 3:6 Mgbe a fụrụ opi nʼobodo, ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji? Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị?
AMO 3:7 Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma.
AMO 3:8 Ọdụm agbọọla ụja, o nwere onye na-agaghị atụ egwu? Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu, onye ga-ahapụ ibu amụma?
AMO 3:9 Kwusaanụ ya nʼobodo niile e wusiri ike nke Ashdọd na ebe niile e wusiri ike nke Ijipt, sị, “Zukọtanụ nʼelu ugwu niile nke Sameria ka unu hụ oke ọgbaaghara nke dị nʼetiti ya na mmegbu niile nke dị nʼetiti ndị ya.”
AMO 3:10 “Ha echezọọla ime ezi ihe.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụ ndị ahụ na-akpakọba ihe e zutere nʼohi na ihe e sitere nʼaka ike pụnara ndị mmadụ nʼime nʼụlọ ha niile e wusiri ike.”
AMO 3:11 Nʼihi ya nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Onye iro na-abịa! Ọ ga-agba ala gị gburugburu; ọ ga-akwatu ebe niile gị bụ nke e wusiri ike, ma kwakọrọkwa ihe niile dị nʼụlọ gị ndị ahụ e wusiri ike.”
AMO 3:12 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Dịka onye ọzụzụ atụrụ si anapụta naanị ọkpụkpụ ụkwụ abụọ maọbụ iberibe ntị site nʼọnụ ọdụm, otu a ka a ga-esi zọpụta ụmụ Izrel bi na Sameria, na nkuku isi ihe ndina na nʼiberibe akwa ọma site nʼelu ihe ndina.”
AMO 3:13 “Nụrụ nke a, ma gbaanụ ama megide ụmụ Jekọb,” ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri.
AMO 3:14 “Nʼụbọchị ahụ, m ga-enye Izrel ahụhụ nʼihi mmehie ha, aghaghị m imebikwa ebe ịchụ aja nke dị na Betel. Mpi dị nʼebe ịchụ aja ka a ga-ebipụkwa, mee ka ha daa nʼala.
AMO 3:15 Aga m etida ụlọ ndị niile ha wuru maka oge oyi, na nke ha wuru maka oge okpomọkụ; aga m ebibikwa ụlọ ndị ahụ niile ha ji ọdụ enyi wuo. Ọtụtụ ebe obibi ha niile ka a ga-etitukwa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
AMO 4:1 Nụrụ okwu a, unu nne ehi nke Bashan, ndị na-ebi nʼelu ugwu Sameria, unu ndị inyom na-emegbu ndị ogbenye, ma zọpịakwa ndị mkpa na-akpa, ndị na-asị di ha, “welatara anyị ihe ọṅụṅụ”
AMO 4:2 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela ịdị nsọ ya ṅụọ iyi, sị, “Ụbọchị ahụ aghaghị ịbịa mgbe a ga-eji nko dọkpụrụ unu pụọ; jiri nko azụ dọkpụrụ ọ bụladị onye ikpeazụ nʼime unu.
AMO 4:3 Ọ bụ site nʼoghere dị iche iche e mere na mgbidi obodo, ka onye ọbụla ga-esi nʼahịrị nʼahịrị pụọ, a ga-atụga unu nʼụzọ Hamon.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
AMO 4:4 “Gaanụ na Betel, ma jehie. Jeenụ Gilgal mee ka mmehie baa ụba. Butenụ ihe aja unu ụtụtụ niile. Webatakwanụ onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri unu nʼụbọchị atọ ọbụla.
AMO 4:5 Chụọnụ aja nsure ọkụ dịka aja ekele, site nʼachịcha koro eko; kpọsaakwanụ banyere onyinye afọ ofufu niile unu na-enye, nyaanụ isi banyere ha, unu bụ ndị Izrel, nʼihi na nke a bụ ihe unu hụrụ nʼanya ime.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
AMO 4:6 “E mere m ka unu nwee eze dị ọcha nʼobodo unu niile, mekwa ka ụkọ nri dị nʼọnụmara unu niile ma unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
AMO 4:7 “Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara mmiri izoro unu, mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido. Enyere m otu obodo mmiri ozuzo, ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ. Mmiri zoro nʼotu ubi, ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ.
AMO 4:8 Ndị si obodo abụọ maọbụ atọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ jee nʼobodo ọzọ, ma ha enwetaghị nke ha ji aṅụju afọ, ma nʼime ihe ndị a niile unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
AMO 4:9 “Ezitere m ọrịa nchakpọ nʼubi unu niile a gbara ogige, ya na ubi vaịnị unu niile, ọtụtụ oge, werekwa ọrịa na-eripịa ihe ubi na ọmụma ebu bibie ha, zitekwa igurube nke richapụrụ osisi fiig na osisi oliv unu niile, ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
AMO 4:10 “Ezitere m nʼetiti unu ajọ ọrịa na-efe efe dịka ndị ahụ m zitere ndị Ijipt. Ejiri m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu, mee ka a dọta ịnyịnya agha unu nʼagha. Emere m ka isisi ọjọọ ndị niile nwuru nʼọmụma ụlọ ikwu unu jupụta imi unu, ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
AMO 4:11 “Akwaturu m ụfọdụ nʼime unu dịka mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra. Unu dịka ọlọkọ nkụ ọkụ alọpụtara site nʼọkụ, ma unu alọghachikwuteghị m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
AMO 4:12 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka m na-aga ime gị, gị bụ Izrel. Ebe ọ bụkwa na ejikerela m ime gị ihe ndị a, jikere, O Izrel, izute Chineke gị.”
AMO 4:13 Ma lee, onye na-akpụ ugwu niile, onye na-ekekwa ifufe, nke na-ekpughekwa echiche uche ya nye mmadụ, onye na-emekwa ka chi ọbụbọ ghọọ ọchịchịrị, na-azọchakwa ugwu niile nʼọbụụkwụ ya, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
AMO 5:1 Nụrụnụ okwu ndị a, nke a ka m na-ekwu megide unu, ọ bụ mkpu akwa maka gị ezinaụlọ nke Izrel:
AMO 5:2 “Izrel, nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, a daala, ọ gaghị ebilite ọzọ, onye a gbahapụrụ nʼala nke aka ya, ọ dịkwaghị onye ga-ekulite ya.”
AMO 5:3 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị Izrel, “Obodo unu nke na-ezipụ puku ndị ike, ka naanị narị ga-afọdụ, obodo unu na-ezipụ narị ndị ike ka naanị iri ga-afọdụrụ.”
AMO 5:4 Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị na-agwa ụlọ Izrel, “Chọọnụ m, ka unu dịrị ndụ.
AMO 5:5 Unu achọla Betel, unu abanyekwala na Gilgal, maọbụ ga ije ruo Bịasheba. Nʼihi na Gilgal aghaghị ije biri nʼala ọzọ, ebe Betel ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu.”
AMO 5:6 Chọọnụ Onyenwe anyị, ka unu dịrị ndụ, ka ọ gharakwa iji ike bịakwasị ụlọ Josef, dịka ire ọkụ, ọ ga-erepịa ha. Betel agaghị enwe onye ga-emenyụ.
AMO 5:7 Unu ndị na-eme ikpe ziri ezi ka ọ ghọọ ihe ilu, na-ekpukwa ezi omume ihu nʼala.
AMO 5:8 Onye mere kpakpando pleiades na orion, onye na-emekwa ka oke ọchịchịrị ghọọ ụtụtụ, na-emekwa ka ụbọchị ghọọ abalị, onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, wụsa ha nʼelu ala akọrọ, Onyenwe anyị bụ aha ya.
AMO 5:9 Onye na-eme ka ịla nʼiyi bịakwasị ndị dị ike nʼotu ntabi anya, na-emekwa ka ịla nʼiyi bịakwasị ebe ahụ niile e wusiri ike.
AMO 5:10 Ọ dị ndị na-akpọ onye na-edebe ikpe ziri ezi nʼụlọikpe asị, na-elelịkwa onye na-ekwu eziokwu anya.
AMO 5:11 Unu na-azọpịa ndị ogbenye, na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha. Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa, ma unu agaghị ebi nʼime ha. Unu akụọla ubi vaịnị mara mma, ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha.
AMO 5:12 Nʼihi na amaara m njehie unu niile, ka ha si baa ụba, matakwa ọtụtụ mmehie unu niile. Unu na-emegbu ndị ezi omume, na-erikwa ngarị. Ma na-achụpụkwa ndị ọ dịghị nke ha nwere nʼọnụ ụzọ ama.
AMO 5:13 Nʼihi ya, onye nwere uche na-ekpuchi ọnụ ya nʼoge ahụ, nʼihi na oge ndị ahụ dị njọ.
AMO 5:14 Chọsienụ ezi ihe ike, ọ bụghị ihe ọjọọ; ka unu dịrị ndụ. Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọnyere unu, dịka unu si kwuo.
AMO 5:15 Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, ma hụnụ ezi ihe nʼanya. Meenụ ka ikpe ziri ezi guzosie ike nʼụlọikpe unu. O nwere ike bụrụ na Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ga-enwe amara nʼahụ ndị fọdụụrụ Josef.
AMO 5:16 Nʼihi ya, nke a ka Onyenwe anyị, Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Onyenwe anyị na-asị, “Oke iti mkpu akwa aghaghị ịdị nʼokporoụzọ niile; ọ bụkwa nʼama niile ka ha ga-asị, azịgbakwa, azịgbakwa. A ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha bịa kwaa akwa, kpọọkwa ndị na-eru ụjụ ka ha bịa tie mkpu akwa.
AMO 5:17 A ga-enwe iti mkpu akwa nʼime ubi vaịnị niile, nʼihi na aga m esi nʼetiti unu gafee,” ka Onyenwe anyị kwuru.
AMO 5:18 Ahụhụ dịrị unu, ndị ahụ na-achọsi ụbọchị Onyenwe anyị ike. Gịnị mere unu ji achọ ụbọchị nke Onyenwe anyị ahụ? Ụbọchị ahụ ga-abụ ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè.
AMO 5:19 Ọ ga-adị ka onye si nʼihu ọdụm na-agbapụ ma zute anụ ọhịa bịa, maọbụ onye gbabara nʼụlọ ya izuike ma tụkwasị aka ya nʼaja ụlọ, agwọ ataa ya.
AMO 5:20 Ụbọchị Onyenwe anyị ọ gaghị abụ ụbọchị ọchịchịrị, na-abụghị ìhè, nke oke ọchịchịrị, a na-agaghị enwe ìhè ọbụla na ya?
AMO 5:21 “Akpọrọ m mmemme oriri na ọṅụṅụ unu asị, ajụla m ya. Nnọkọ nke oke nzukọ unu adịghị atọkwa m ụtọ.
AMO 5:22 A sịkwarị na unu bunyere m aja nsure ọkụ unu na aja mkpụrụ ọka unu, agaghị m anabata ha. Aja udo nke anụ unu gbara abụba abụrụghị m ihe ọbụla.
AMO 5:23 Sitenụ nʼebe m nọ wezuga ụzụ ịbụ abụ unu. Agaghị m ege ntị nʼabụ ụbọ akwara unu.
AMO 5:24 Kama meenụ ka ikpe ziri ezi na-asọgharị dịka mmiri, ka ezi omume na-asọgharịbiga oke dịka iyi nke na-adịghị ata ata.
AMO 5:25 “Iri afọ anọ ndị ahụ unu nọ nʼọzara, unu chụụrụ m aja, unu o wetara m onyinye, unu ụlọ Izrel?
AMO 5:26 Unu ga-ebuli eze unu Sakut elu, na arụsị Kayiwan, chi kpakpando unu, bụ onyinyo unu, na chi niile a kpụrụ akpụ, nke unu kpụrụ nye onwe unu.
AMO 5:27 Ya mere, aghaghị m ime ka e buru unu gaa nʼala ndị ọzọ, nʼofe Damaskọs,” ka Onyenwe anyị, Onye ahụ aha ya bụ Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
AMO 6:1 Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-enweghị nsogbu nʼime Zayọn, na ndị ahụ na-ebi nʼizuoke nʼugwu Sameria, bụ ndị a maara aha ha na isi mba nke mba niile, ndị agbụrụ Izrel niile na-abịakwute.
AMO 6:2 Gaanụ Kalne, ka unu lee ya anya, site nʼebe ahụ unu jeruo Hamat, obodo ukwu ahụ, mgbe ahụ unu gbada jeruokwa Gat nke dị na Filistia Ha ọ kacha alaeze abụọ unu mma? Ka ala ha ọ karịrị ndị nke unu?
AMO 6:3 Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ ma na-eme ka ụbọchị ihe ike bịa ngwangwa.
AMO 6:4 Azịgba unu ndị na-edina nʼelu akwa ọdụ enyi, na-agbatị onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-erikwa anụ ụmụ atụrụ dị mma na ụmụ ehi e mere ka ha gbaa abụba.
AMO 6:5 Ndị na-abụ abụ nke na-abaghị nʼụda ụbọ akwara, ma were aka ha rụọra onwe ha ngwa egwu dịka Devid mere.
AMO 6:6 Unu na-aṅụ mmanya site nʼọba; na-ete mmanụ makarịsịrị mma, ma ịla nʼiyi nke Josef adịghị ewute ha.
AMO 6:7 Nʼihi ya, unu ga-abụ ndị a ga-ebu ụzọ mee ka ha jee biri nʼala ndị ọzọ. Na mberede, oke oriri unu na idina ala setịa onwe unu ga-akwụsị.
AMO 6:8 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela onwe ya ṅụọ iyi, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ekwupụtala sị, “Ihe arụ ka mfụli elu nke Jekọb bụrụ m; ana m akpọkwa ebe ya niile e wusiri ike asị. Nʼihi ya, aghaghị m iwere obodo a na ihe niile dị ya nʼime nyefee nʼaka ndị ọzọ.”
AMO 6:9 Ma ọ bụrụ na mmadụ iri afọdụ nʼime otu ụlọ, ha niile aghaghị ịnwụ.
AMO 6:10 Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha Onyenwe anyị.”
AMO 6:11 Nʼihi na lee, Onyenwe anyị e nyela iwu. Ọ ghaghị itikpọsị ụlọ ukwu ndị ahụ, tiriekwa ụlọ nta ndị ahụ niile.
AMO 6:12 Ịnyịnya ọ na-agba ọsọ nʼelu nkume? Mmadụ ọ na-eji ehi abụọ e jikọtara ọnụ akọ elu osimiri? Ma unu atụgharịala ikpe ziri ezi mee ya ka ọ ghọọ nsi, mkpụrụ nke ezi omume ka unu mekwara ka ọ ghọọ ihe ilu.
AMO 6:13 Unu ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na unu meriri obodo Lo Deba, ndị na-asị, “Ọ bụghị site nʼike aka anyị ka anyị nwetakwara Kanaịm?”
AMO 6:14 “Ma lee, aghaghị m ime ka otu mba bilie imegide unu, ụlọ Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. “Ha ga-emekpa unu ahụ site nʼụzọ niile site na Lebo Hamat ruo ndagwurugwu Araba.”
AMO 7:1 Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka m hụ. Lee, ọ na-akwado igwe igurube nke ga-abịa bibie ihe ubi niile ga-etopụta mgbe e burula ụzọ wee ihe ubi nke mbụ nke a na-enye eze, dịka ihe ruuru ya.
AMO 7:2 Mgbe ha tachara ahịhịa niile dị nʼala ahụ, etiri m mkpu: “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko arịọọ m gị, gbaghara. Jekọb ọ ga-esi aṅa guzosie ike? Lee, ọ dịkarịrị nta.”
AMO 7:3 Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a. Onyenwe anyị kwuru sị, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”
AMO 7:4 Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m: Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-akpọku ọkụ iji ya kpee ikpe. Ọkụ ahụ repịara ogbu mmiri, repịakwa ala ahụ niile.
AMO 7:5 Mgbe ahụ, asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, arịọọ m gị kwụsị! Olee otu Jekọb ga-esi guzosie ike? Lee na ọ dịkarịrị nta!”
AMO 7:6 Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”
AMO 7:7 Nke a ka o gosiri m, lee, Onyenwe anyị na-eguzo nʼakụkụ mgbidi nke e ji ihe ịtụ mgbidi tụọ nke ọma, o jikwa ihe ịtụ mgbidi nʼaka ya.
AMO 7:8 Onyenwe anyị sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ihe ịtụ mgbidi.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru, “Lee, mụ onwe m na-edo ihe ịtụ mgbidi nʼetiti ndị m bụ Izrel, agaghịkwa m esi ebe ha nọ gafee.
AMO 7:9 “Ebe niile e wuliri elu nke Aịzik aghaghị ịbụ ebe e mebiri emebi, ebe nsọ niile nke Izrel aghaghị ịbụ ebe tọgbọrọ nʼefu, aghakwaghị m iweli mma agha m elu iji megide ụlọ Jeroboam.”
AMO 7:10 Mgbe ahụ, Amazaya onye nchụaja nọ na Betel zigaara Jeroboam bụ eze Izrel ozi na-asị, “Emọs na-akwalị izu nzuzo ka ọ megide gị nʼetiti ụlọ Izrel, ala apụghị ibu okwu niile sị ya nʼọnụ apụta.
AMO 7:11 Nke bụ ihe Emọs nọ na-asị, “ ‘Jeroboam aghaghị ịnwụ site na mma agha, Izrel aghakwaghị isite nʼala amụrụ ha jee biri nʼala ọzọ, dịka ndị a dọtara nʼagha.’ ”
AMO 7:12 Mgbe ahụ, Amazaya gwara Emọs, “Gị onye ọhụ ụzọ, gbara ọsọ gbalaa ala Juda. Jee nʼebe ahụ, rie achịcha nke sitere nʼibu amụma gị, nọrọkwa nʼebe ahụ buo amụma gị.
AMO 7:13 Ebula amụma ọzọ na Betel, nʼihi na ọ bụ ebe nsọ nke eze, ọ bụkwa ụlọnsọ ukwu nke alaeze ya.”
AMO 7:14 Mgbe ahụ, Emọs zaghachiri Amazaya, “Ọ dịghị mgbe m bụ onye amụma, abụkwaghị m nwa onye amụma, kama abụ m onye na-elekọta igwe ewu na atụrụ, na onye ọrụ na-azụ osisi sikamọ.
AMO 7:15 Ma Onyenwe anyị sitere nʼebe ịzụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta m, Onyenwe anyị sịrị m: ‘Gaa buoro ndị m Izrel amụma.’
AMO 7:16 Nʼihi ya, ugbu a nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma unu na-asị, “ ‘Ebula amụma megide Izrel, ekwukwala okwu megide ụlọ Aịzik.’
AMO 7:17 “Ya mere, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Nwunye gị ga-aghọ nwanyị na-agba akwụna nʼime obodo. Ụmụ gị ndị nwoke na ndị nwanyị ka a ga-eji mma agha gbuo. A ga-atụ ala gị nʼihe ọtụtụ, kewasịa ya nye ndị ọzọ, ma gị onwe gị ga-anwụ nʼala rụrụ arụ. A ghakwaghị ịdọta Izrel nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ.’ ”
AMO 8:1 Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m. Otu nkata nke mkpụrụ osisi ọkọchị chara acha jupụtara.
AMO 8:2 Ọ sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m: “Otu nkata nke mkpụrụ osisi chara acha jupụtara nʼime ya.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Oge ọgwụgwụ abịakwasịla ndị m, Izrel. Agaghị m ewezugakwa ntaramahụhụ dịrị ha.”
AMO 8:3 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, “Nʼụbọchị ahụ, abụ niile nke a na-abụ nʼime ụlọnsọ ukwu ga-aghọ iti mkpu akwa. Ọtụtụ, ọtụtụ ozu ndị nwụrụ anwụ, nʼebe niile ọbụla ka atụpụsịrị ha! Mkpọtụ ọbụla adịghịkwa!”
AMO 8:4 Nụrụnụ nke a, unu ndị na-azọpịa ndị mkpa na-akpa, na-emekwa ka ụmụ ogbenye dị nʼala a gwụsịa,
AMO 8:5 na-asị, “Olee mgbe ọnwa ọhụrụ ga-agafe ka anyị ree mkpụrụ ubi, na mgbe ụbọchị izuike ga-agwụ ka anyị ree ọka wiiti?” Ka anyị jiri ihe ọtụtụ dị nta, na ibuli ọnụ ngwa ahịa elu, na aghụghọ site nʼiji ihe ọtụtụ na-ezughị ezu.
AMO 8:6 Jiri ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye, jirikwa akpụkpọụkwụ abụọ anyị zụta ndị mkpa na-akpa, ma reekọta ọka wiiti anyị zachatara nʼala ya na ezi ọka wiiti.
AMO 8:7 Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, “Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ.”
AMO 8:8 Ọ bụ na ala agaghị ama jijiji nʼihi nke a, ndị niile bi nʼime ya ha agaghị eru ụjụ? Ala a niile ga-etoju dịka osimiri Naịl, a ga-eme ka ọ magharịa malie elu, ma tachaa dịka iyi Ijipt.
AMO 8:9 “Ma nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, “Aga m eme ka anyanwụ daa nʼetiti ehihie, ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị.
AMO 8:10 Aghaghị m ime ka ụbọchị oke oriri unu ghọọ ụbọchị iru ụjụ; gbanwee abụ unu niile ka ha ghọọ abụ akwa. Aga m eme ka onye ọbụla nʼime unu yiri akwa mkpe, meekwa ka unu kpụchaa isi unu. Aga m eme ka ụbọchị ahụ dịrị ka ụbọchị a na-eru ụjụ, nʼihi otu mkpụrụ nwa nwoke nwụrụ anwụ. Ọgwụgwụ ya ga-adịka ụbọchị na-elu ilu ilu.
AMO 8:11 “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, “mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala, ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị.
AMO 8:12 Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ, sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ; ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị, ma ha agaghị achọta ya.
AMO 8:13 “Nʼụbọchị ahụ, “ụmụ agbọghọ ndị mara mma ile anya, na ụmụ okorobịa ndị dị ike ga-ada mba nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.
AMO 8:14 Ndị ahụ na-eji mmehie Sameria na-aṅụ iyi, ndị na-asị, ‘Dịka chi gị na-adị ndụ, gị Dan,’ nakwa, ‘Ebe ọ bụ na chi ndị Bịasheba na-adị ndụ,’ ha ga-ada, ha agakwaghị ebilite ọzọ.”
AMO 9:1 Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ guzo nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ọ sịrị, “Tie ọnụ ogidi ndị a ihe, ruo mgbe mbata ọnụ ụzọ ha niile mara jijiji. Tipịasịa ha nʼisi mmadụ niile; aga m ejikwa mma agha gbuo ndị niile fọdụrụ. Ọ dịghị onye ga-agbapụ, ọ dịkwaghị onye ga-ewezuga onwe ya.
AMO 9:2 Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ, site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha, ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe, site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala.
AMO 9:3 Ọ bụrụkwa na ha ezoo onwe ha nʼelu Kamel nʼebe ahụ ka m ga-esi chọpụta ha, kpụrụ ha, a sịkwa na ha ezoo onwe ha nʼala oke osimiri, nʼebe ahụ ka m ga-enye ajụala nke mmiri iwu ka ọ taa ha.
AMO 9:4 Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ, nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha. “Aga m elekwasị ha anya m abụọ nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.”
AMO 9:5 Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-emetụ ala aka mee ka ọ gbazee, ime ka ndị niile bi nʼala ruo ụjụ; ala ya niile bilie na-ebili dịka mmiri nke osimiri Naịl, nke na-emesịakwa dajụọ dịka mmiri Ijipt.
AMO 9:6 Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile, na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa. Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, ma na-awụsa ha nʼala, aha ya bụ Onyenwe anyị.
AMO 9:7 “Ọ bụ na unu ndị Izrel adịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel, site na Kafto kpọpụta ndị Filistia, ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia?
AMO 9:8 “Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie. Aghaghị m ịla ya nʼiyi, kpochapụ ya site nʼelu ụwa, naanị na m agaghị ebibicha ụlọ Jekọb kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
AMO 9:9 “Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu, aga m ayọgharị ụlọ Izrel nʼetiti mba niile dịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ, ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala.
AMO 9:10 Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m, ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị, anyị agaghị ezute ya, aghaghị ịnwụ site na mma agha.’
AMO 9:11 “Nʼụbọchị ahụ, “aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa. Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji, mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ. Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ.
AMO 9:12 Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.” Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya.
AMO 9:13 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi, onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa. Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta, ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta.
AMO 9:14 Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta. “Ha ga-ewugharị obodo niile tọgbọrọ nʼefu, birikwa nʼime ha. Ha ga-akụ ubi vaịnị a gbara ogige, ṅụọkwa mmanya si na ya. Ha ga-arụkwa ubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya.
AMO 9:15 Aga m akụ Izrel nʼala ha. A gaghị ehopukwa ha ọzọ site nʼala ahụ bụ nke m nyere ha.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Chineke unu kwuru.
OBA 1:1 Ọhụ nke Ọbadaya hụrụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere Edọm. Anyị anụla ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị, e zipụla onyeozi ka ọ gaa mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Bilikwanụ ka anyị gaa buo agha megide ya.”
OBA 1:2 “Lee, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche; ị ga-abụ ihe a na-elelị anya nke ukwuu.
OBA 1:3 Nganga nke obi gị eduhiela gị, gị onye bi na mgbawa niile nke nkume dị elu, onye ebe obibi ya dị nʼebe dị oke elu. Gị onye na-ekwu nʼime obi ya, ‘Onye ga-akpụdata m nʼala?’
OBA 1:4 A sịkwarị na i felie elu dịka ugo, ọ bụrụkwa na ị kpaa akwụ gị nʼetiti kpakpando, aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
OBA 1:5 “Ọ bụrụ na ndị ohi abịakwute gị, e, ọ bụrụ na ndị na-apụnara mmadụ ihe abịakwute gị nʼetiti abalị, lee, ụdị mbibi na-echere ịdakwasị gị! Ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-ezuru? Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị, ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?
OBA 1:6 Ma lee ka e si nyochapụtachaa ebe niile Ịsọ debere akụ ya, lekwaa ka e si chịkọrọ akụ ya niile bụ nke zoro ezo!
OBA 1:7 Ndị enyi gị niile aghọgbuola gị, nwee ike imegide gị, ndị gị na ha na-adị na mma achụrụla gị ruo nʼoke ala; ndị gị na ha na-erikọ nri gị ga-esiri gị ọnya igbudu, ma ị gaghị achọpụta ya.
OBA 1:8 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi, bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ?
OBA 1:9 Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri. Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile, ka a ga-egbuda nʼagha.
OBA 1:10 Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike. Ihere ga-ekpuchi gị; a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
OBA 1:11 Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị, na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya, sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee fee nza iji kerie Jerusalem. Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha.
OBA 1:12 Ma ị garaghị eleda nwanne gị anya nʼụbọchị nsogbu ya, ị garaghị aṅụ ndị Juda nʼụbọchị ahụ e bibiri ha. Ị garaghị anyara ha isi nʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu.
OBA 1:13 I kwesighị isite nʼọnụ ụzọ ama ndị m zọọ ije nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, o zighị ezi na i ga-enwe obi aṅụrị nʼoge ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, maọbụ jiri aka ike pụnara ha akụ ha nʼụbọchị nsogbu ha.
OBA 1:14 I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọ igbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ, maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha, nʼụbọchị nsogbu ha.
OBA 1:15 “Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nso nye mba niile. Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị; ihe i metara ga-adị gị nʼisi.
OBA 1:16 Dịka i si site nʼugwu nsọ m ṅụọ ihe ọṅụṅụ otu a ka mba niile gbara gị gburugburu ga-esi ṅụọ ma na-adagharị. Ha ga-aṅụ, ṅụọ, ma ọ gaghị adị ha ka o nwere ihe ha na-aṅụ.
OBA 1:17 Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ, ọ ga-adị nsọ, ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ.
OBA 1:18 Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ, ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ: ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka. Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya. Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụ site nʼụlọ Ịsọ.” Onyenwe anyị ekwuola ya.
OBA 1:19 Mgbe ahụ, ndị bi na Negev ga-ebichi nʼugwu ugwu Ịsọ, ndị si na Shefela ga-enwekọta ala ndị Filistia. Ha ga-anọchi ala ubi niile nke ndị Ifrem na nke Sameria. Ndị Benjamin ga-enwetakwa Gilead.
OBA 1:20 Ụmụ Izrel gbara ọsọ ndụ gaa na Hala, ga-enweta, bido nʼala Fonisia ruo Zarefat. Ndị ahụ e mere ka ha si Jerusalem gaa biri na Sefarad, ga-enwetakwa obodo niile nke Negeb.
OBA 1:21 Ndị nnapụta ga-agbago nʼugwu Zayọn maka ịchị ugwu Ịsọ niile. Mgbe ahụ alaeze niile ga-abụkwa nke Onyenwe anyị.
JON 1:1 Okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jona nwa Amitai, na-asị,
JON 1:2 “Bilie, gaa Ninive, bụ obodo ukwu ahụ, kwusaa okwu megide ya, nʼihi na ajọ omume ha abịarutela nʼihu m.”
JON 1:3 Ma Jona gbapụrụ ọsọ site nʼihu Onyenwe anyị chee ihu ya ije Tashish. O biliri jee Jopa, nʼebe ọ hụrụ ụgbọ mmiri nke na-aga Tashish. Ọ kwụrụ ụgwọ ije ụgbọ, banye isoro gaa Tashish ka o nwee ike gbapụ site nʼihu Onyenwe anyị.
JON 1:4 Ma Onyenwe anyị mere ka ifufe dị egwu malite ife nʼelu osimiri ahụ, ebili mmiri bidokwara na-amagharị, chọọ itiwasị ụgbọ mmiri ahụ.
JON 1:5 Mgbe ahụ, ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ ahụ tụrụ oke egwu, malite itiku chi ha. Ha malitekwara itufu ihe niile dị nʼụgbọ mmiri ahụ, ime ka ụgbọ ahụ dị mfe. Ma nʼoge ihe ndị a na-eme, Jona nọrịị nʼala ala ụgbọ mmiri ahụ ebe o dinara ala na-arahụ ụra.
JON 1:6 Onyeisi ụgbọ jekwuru Jona sị ya, “Gịnị ka ị nọ nʼebe a na-eme, ị na-arahụ ụra? Bilie, kpọkuo chi gị, ma eleghị anya o nwere ike ileta anyị anya, meere anyị ebere, zọpụta anyị.”
JON 1:7 Mgbe ahụ, ndị nọ nʼụgbọ sịrịtara ibe ha, “Bịanụ ka anyị fee nza mata onye ihe ọjọọ dị otu a sị nʼaka ya bịakwasị anyị.” Ya mere, ha fere nza, nza ahụ a maa Jona.
JON 1:8 Nʼihi ya, ha sịrị ya, “Gwa anyị, onye mere ka ihe dị otu a bịakwasị anyị. Gịnị bụ ọrụ gị? Ebee ka i si bịa? Ị bụ onye obodo ebee? Ole agbụrụ i si na ya pụta?”
JON 1:9 Ọ sịrị, “Abụ m onye Hibru, na onye na-akpọ isiala nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nke eluigwe, onye kere osimiri na ala akọrọ.”
JON 1:10 Egwu dị ukwuu tụrụ ụmụ nwoke ahụ, ha sịrị ya, “Gịnị ka i mere?” Nʼihi na ha matara na o si nʼihu Onyenwe anyị na-agbapụ ọsọ, nʼihi na ọ gwala ha rịị na ọ bụ otu o si dị.
JON 1:11 Ma ebili mmiri ahụ gara nʼihu na-amali nʼike nʼike. Nʼihi ya, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme gị, nke ga-eme ka osimiri dajụọ?”
JON 1:12 Ọ gwara ha, “Bulienụ m tụnye nʼime osimiri. Nke a ga-emekwa ka ọ dajụọ. Nʼihi na amaara m na ọ bụ nʼihi m ka ebili mmiri ọjọọ a ji na-abịakwasị unu.”
JON 1:13 Kama, ndị ikom ahụ ji ike nyasie ụgbọ ahụ ichigharị ya laghachi nʼelu ala, ma ha enweghị ike. Nʼihi na oke osimiri ahụ na-amali elu karịa ka ọ dị na mbụ.
JON 1:14 Mgbe ahụ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Onyenwe anyị, biko ekwela ka anyị nwụọ nʼihi ọnwụ nwoke a. Biko, atụkwasịkwala ọbara nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ nʼisi anyị, nʼihi na gị Onyenwe anyị emeela dịka i si chọọ.”
JON 1:15 Ya mere, ha buliri Jona elu tụnye ya nʼime osimiri ahụ, ebili mmiri ahụ dajụkwara.
JON 1:16 Mgbe nke a mere ndị ikom ahụ tụrụ egwu Onyenwe anyị nke ukwuu. Ha chụụrụ Onyenwe anyị aja, kwekwa ya nkwa dị iche iche.
JON 1:17 Ma Onyenwe anyị akwadolarị otu azụ buru ibu ka o loo Jona. Ya mere, Jona nọrọ nʼafọ azụ ahụ ụbọchị atọ, ehihie na abalị.
JON 2:1 Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere.
JON 2:2 Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị, ọ zakwara m. Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị, ị nụkwara olu akwa m.
JON 2:3 Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi, nʼetiti oke osimiri. Osimiri dịkwa m gburugburu, ebili mmiri gị na mmali mmiri gị gabigakwara m nʼisi.
JON 2:4 Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị chụpụ m; ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’
JON 2:5 Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m, ogbu mmiri na-erikpu m. Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.
JON 2:6 Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri, ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi. Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ, Onyenwe anyị, bụ Chineke m.
JON 2:7 “Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike, e chetara m gị Onyenwe anyị, ma ekpere m bịakwutere gị, nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.
JON 2:8 “Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara, na-agbakụta ebere Chineke azụ.
JON 2:9 Ma ọ bụ olu abụ ekele ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja. Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere. Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ ”
JON 2:10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.
JON 3:1 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jona ntị nke ugboro abụọ na-asị,
JON 3:2 “Bilie, jee nʼobodo ukwu ahụ bụ Ninive, kwusaara ya ozi ahụ m ziri gị.”
JON 3:3 Jona biliri gaa Ninive dịka okwu nke Onyenwe anyị si dị. Ninive bụ nnọọ obodo dị ukwuu, nke ga-ewe ụbọchị atọ ịga ya gburugburu.
JON 3:4 Jona malitere ịba nʼobodo ahụ, ma mgbe ọ gara ije otu ụbọchị, o kwusara sị, “Iri ụbọchị anọ ka ọ fọdụrụ tupu alaa Ninive nʼiyi.”
JON 3:5 Ndị Ninive kwenyeere na Chineke, kpọsaa obubu ọnụ, ha niile site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta, onye ọbụla yikwasịrị uwe mkpe.
JON 3:6 Mgbe akụkọ a rutere eze Ninive ntị, o sitere nʼocheeze ya rituo, wezuga uwe eze ya, yikwasị uwe mkpe, nọkwasịkwa na ntụ.
JON 3:7 Nke a bụ nkwusa ya nʼime Ninive: Nke a bụ iwu sitere nʼaka eze na ndị a maara aha ha: “Ka mmadụ ọbụla, maọbụ anụmanụ, igwe ehi maọbụ anụ ụlọ ọbụla, ghara idetu ihe ọbụla nʼọnụ, ka ha ghara iri ihe maọbụ ṅụọ mmiri.
JON 3:8 Kama ka onye ọbụla yiri akwa mkpe, ma mmadụ ma anụmanụ, ka ha kpọkusikwaa Chineke ike, ka ha sikwa nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa, sikwa nʼọrụ ọjọọ ha na ime ihe ike ha niile chegharịa.
JON 3:9 Onye maara? Ma eleghị anya, Chineke ga-ejide oke iwe ya, ma site nʼọmịiko ya wezuga iwe ọkụ ya si otu a mee ka anyị ghara ịla nʼiyi.”
JON 3:10 Mgbe Chineke hụrụ ihe niile ha mere, na otu ha siri site nʼụzọ ọjọọ ha niile chegharịa, Chineke chegharịrị uche banyere ịla ha nʼiyi. O mekwaghị ka nzube ya ibibi obodo ahụ mezuo.
JON 4:1 Ma ihe a jọrọ Jona njọ nʼobi nke ukwuu, iwe ya dịkwa ọkụ.
JON 4:2 Nʼihi ya, o kpeere Onyenwe anyị ekpere sị, “O, Onyenwe anyị, nke a ọ bụghị ihe m kwuru, mgbe m nọ nʼala m? Ọ bụ ya mere m ji chọọ ịgbalaga na Tashish na mbụ nʼihi na amaara m na ị bụ Chineke onye na-eme amara, na onye jupụtara nʼobi ebere, na onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, nke bara ụba nʼịhụnanya, onye na-anaghị ata mmadụ ahụhụ dịka mmehie ya siri dị.
JON 4:3 Ugbu a, O, Onyenwe anyị napụ m ndụ m. Ọ ga-adị m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ.”
JON 4:4 Ma Onyenwe anyị sịrị, “O ziri ezi na ị ga-esi otu a wee oke iwe dị ọkụ?”
JON 4:5 Mgbe ahụ, Jona si nʼebe ahụ pụọ jee nọdụ ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ. O weere ahịhịa meere onwe ya ụlọ ndo, nọdụ nʼime ya, chere ka ọ hụ ihe gaje ime obodo ahụ.
JON 4:6 Ma Onyenwe anyị Chineke rọpụtara otu osisi nwere akwụkwọ sara mbara, nke tolitere nʼelu isi Jona, ka o ghọọrọ ya ndo ịnapụta ya nʼọnọdụ ahụ mgbakasị. Jona ṅụrịrị ọṅụ maka osisi ahụ.
JON 4:7 Ma nʼisi ụtụtụ echi ya, Chineke mere ka otu ikpuru pụta nke riri osisi ahụ site nʼogwe ya, si otu a mee ka ọ kpọnwụọ.
JON 4:8 O ruo, mgbe anyanwụ wara, Chineke mere ka ifufe na-ekpo ọkụ site nʼọwụwa anyanwụ, anyanwụ a chara Jona nʼisi nke ukwuu nke mere nʼike gwụsịrị ya. Ọ rịọrọ ka ọnwụ gbuo ya, na-asị, “ọ ga a kaara m mma na m nwụrụ anwụ, karịa na m dị ndụ.”
JON 4:9 Ma Chineke sịrị Jona, “Ọ bụ ihe ziri ezi ka i wee iwe maka osisi a?” Ọ sịrị, “E, ana m ewe oke iwe, ọ bụladị na m chọrọ ịnwụ.”
JON 4:10 Mgbe ahụ Onyenwe anyị kwuru, “I nwere obi ebere nʼebe osisi a dị, nke ị na-akụghị na nke i mekwaghị ka o too, bụ nke toro nʼanyasị, nwụọkwa nʼanyasị.
JON 4:11 Mụ onwe m, m ga-aghara inwe obi ebere nʼahụ obodo ukwu a dịka Ninive, nke nwere ihe karịrị narị puku ndị mmadụ na iri puku mmadụ abụọ, bụ ndị na-amaghị nke bụ aka nri ha maọbụ aka ekpe ha, na nke ọtụtụ anụmanụ dịkwa nʼime ya?”
MIC 1:1 Nke a bụ okwu Onyenwe anyị nke bịaara Maịka, onye Moreshet, nʼoge eze Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda. Ọhụ nke ọ hụrụ banyere Sameria na Jerusalem.
MIC 1:2 Geenụ ntị, unu ndị mmadụ, unu niile, gee ntị, gị ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gbaa akaebe megide unu, bụ Onyenwe anyị site nʼụlọnsọ ukwu ya.
MIC 1:3 Lee! Onyenwe anyị na-abịa! O si nʼebe obibi ya na-abịa. Ọ na-abịa ma na-azọda ebe niile dị elu nke ụwa.
MIC 1:4 Ugwu ukwu niile na-agbaze nʼokpuru ụkwụ ya, ndagwurugwu niile na-agbawa, dịka abụba dị nso nʼọkụ, dịka mmiri si nʼebe dị elu na-asọdata
MIC 1:5 Ihe ndị a bụ nʼihi njehie Jekọb, nʼihi mmehie niile nke ndị Izrel. Gịnị bụ njehie Jekọb? Ọ bụghị Sameria? Gịnịkwa bụ ebe dị elu nke Juda? Ọ bụghị Jerusalem?
MIC 1:6 “Nʼihi ya, aga m eme ka Sameria ghọọ mkpọmkpọ ebe, ebe a na-akụ osisi vaịnị. Aga m awụnye nkume ya nʼime ndagwurugwu, mekwaa ka ntọala ya pụta ihe.
MIC 1:7 Arụsị ha niile a pịrị apị ka a ga-akụjisi; onyinye niile a na-ewebata nʼụlọ arụsị ha ka a ga-akpọ ọkụ. Aga m ala arụsị niile ya a kpụrụ akpụ nʼiyi. Ebe ọ bụ na e si nʼaka ndị na-agba akwụna na-ewebata onyinye ndị a, a ga-eji ha kwụọ ụgwọ ịgba akwụna.”
MIC 1:8 Nʼihi nke a, aga m akwa akwa, tikwaa mkpu akwa. Aga m agbara ọtọ gbarakwa ụkwụ efu jegharịa. Aga m akpọ mkpu dịka nkịta ọhịa, tipụkwa ube akwa dịka ikwighịkwighị.
MIC 1:9 Nʼihi na ọnya ya enweghị ngwọta, o rutela na Juda. O rutelarị ma nʼọnụ ụzọ ama nke ndị m, rukwaarị Jerusalem.
MIC 1:10 Unu ekwutela okwu ya na Gat; unu akwakwala akwa ọbụla. Tụrụọnụ onwe unu nʼuzuzu, unu ndị Bet-Ofra.
MIC 1:11 Gabiganụ nʼụzọ unu, unu ndị bi na Shafia. Nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ihere unu, unu ndị bi na Zaanan abịakwala nso. Ndị Bet-Ezel na-eru ụjụ nʼihi na e wezugala ndị na-eche unu nche.
MIC 1:12 Ndị bi na Marot nọ nʼoke ahụ mgbu na-eche ka ihe ọma bịa, nʼihi na mbibi esitela nʼaka Onyenwe anyị bịa, ruo nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem
MIC 1:13 Unu ndị bi na Lakish kegidenụ ịnyịnya unu na-agba ọsọ nʼụgbọ agha. Ọ bụ nʼebe ahụ ka mmehie nwaada Zayọn malitere, nʼihi na mmehie Izrel na-eme ka a hụrụ nʼetiti unu.
MIC 1:14 Ya mere, unu ga-enye Moreshet dị na Gat onyinye mgbe unu na-agbapụ ọsọ. Ụlọ Akzib ga-emesịa ghọọ ụlọ aghụghọ nye ndị eze Izrel.
MIC 1:15 Aga m akpọbata onye ga-emeri unu ndị bi na Maresha nʼagha. Ndị a na-asọpụrụ nke Izrel ga-agbabanye nʼAdulam.
MIC 1:16 Kpachaanụ isi unu nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi ụmụntakịrị ndị ahụ ihe ha masịrị unu, meenụ ka isi unu kwọchaa dịka isi udele, nʼihi na a ga-achụpụ ha site nʼebe unu nọ gaa mba ọzọ.
MIC 2:1 Ahụhụ na-adịrị ndị na-eche ihe ọjọọ nʼobi ha, na ndị niile na-edina nʼakwa ha na-eche ajọ echiche. Mgbe chi bọrọ, ha na-arụzu ihe ha chepụtara, nʼihi na ikike imezu ya dị nʼaka ha.
MIC 2:2 Ha na-enwe anya ukwu nʼebe ubi ndị ọzọ dị, were ha nʼaka ike, na ụlọ dị iche iche, ha ewere ha nʼike. Ha na-ejikwa aka ike nara ndị mmadụ ụlọ ha, ha na-ezunara ha ihe nketa ha.
MIC 2:3 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị, “Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a, nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu. Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa, nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ.
MIC 2:4 Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu, ha ga-abụrụ unu abụ iru ụjụ iji ya kọchaa unu na-asị, ‘Anyị abụrụla ndị lara nʼiyi, e kesaala ihe nnweta nke ndị m, ọ napụla m ha. O werela ubi anyị nyefee ha nʼaka ndị ahụ meriri anyị nʼagha.’ ”
MIC 2:5 Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị, onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza.
MIC 2:6 Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.” “Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a, ihere agaghị eme anyị.”
MIC 2:7 Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb? “Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla? Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?” “Ọ bụ na okwu m adịghị eme onye ụzọ ya ziri ezi mma?
MIC 2:8 Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m dịka ndị iro. Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta, dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta.
MIC 2:9 Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m site nʼụlọ afọ ojuju ha. Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị m ruo mgbe ebighị ebi.
MIC 2:10 Bilienụ, pụọnụ, nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike, nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya, o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire.
MIC 2:11 Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị, ‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’ ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ.
MIC 2:12 “Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb, aga m akpọkọta ndị niile fọdụrụ nʼIzrel nʼotu ebe. Aga m akpọkọta ha dịka atụrụ nʼime ọgba anụ, dịka igwe ewu na atụrụ nʼebe ịta nri ya, ndị mmadụ ga-ejupụtakwa nʼebe ahụ.
MIC 2:13 Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha. Ha ga-etipukwa ọnụ ụzọ ama ahụ, ma site na ya gafee. Eze ha ga-agabigakwa nʼihu ha, Onyenwe anyị ga-anọ nʼisi.”
MIC 3:1 Mgbe ahụ ekwuru m sị, “Geenụ ntị unu ndịisi ụlọ Jekọb, na unu ndị na-achị ezinaụlọ Izrel. Ọ bụ na unu ekwesighị ịmata ikpe ziri ezi
MIC 3:2 unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya. Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụ na-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha.
MIC 3:3 Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m, na-agba ha akpụkpọ, na-etijisi ọkpụkpụ ha, na-egburi anụ ahụ ha, dịka anụ a na-esinye nʼite.”
MIC 3:4 Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị, ma ọ gaghị aza ha! Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.
MIC 3:5 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “Banyere ndị amụma bụ ndị na-eduhie ndị m, mgbe ha nwere ihe ha ga-eri, ha na-ekwusa ‘Udo’ ma ọ bụrụ na mmadụ enyeghị ha nri, ha na-ebili buo agha megide onye dị otu a.
MIC 3:6 Ya mere nʼabalị ga-abịakwasị ha, napụ ha ike ịhụ ọhụ; ọchịchịrị ga-ekpuchi ha, ka ha ghara ịjụta ase ọbụla. Anwụ ga-ada nʼebe ndị amụma ahụ nọ, ụbọchị ga-agbakwa ọchịchịrị nye ha.
MIC 3:7 Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme, ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ. Ha ga-ekpuchi ihu ha, nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha.”
MIC 3:8 Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike, ejupụtara m na Mmụọ nke Onyenwe anyị, jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi, na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya, na nye Izrel mmehie ya.
MIC 3:9 Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb, na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel. Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị, ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi.
MIC 3:10 Ndị ji ọbara wuo Zayọn, werekwa ajọ omume wuo Jerusalem.
MIC 3:11 Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị, ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ, ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego. Ma ha dabere na Onyenwe anyị na-asị, “Onyenwe anyị ọ nọnyeereghị anyị? O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị.”
MIC 3:12 Ọ bụ nʼihi gị ka a ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi, Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.
MIC 4:1 Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, ndị dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi.
MIC 4:2 Ọtụtụ mba ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.
MIC 4:3 Ọ ga-ekpe ikpe dị nʼetiti ndị dị iche iche, doziekwa esemokwu dị nʼetiti mba na mba ibe ya ruo ebe dị anya. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile, mee ka ha bụrụ mma oge, kpụgharịkwa ùbe ha ka ha ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.
MIC 4:4 Onye ọbụla ga-anọdụrụ onwe ya nʼokpuru vaịnị na nʼokpuru osisi fiig ya, nʼihi na o nweghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu ọzọ. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya.
MIC 4:5 Mba dị iche iche ga-agagharị nke ọbụla nʼaha chi ya, ma anyị onwe anyị ga na-aga nʼaha Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.
MIC 4:6 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “aga m achịkọta ndị ngwụrọ, chịkọtaa ndị ahụ niile e mere ka ha biri na mba ọzọ, na ndị ahụ niile m mere ka ha ruo ụjụ.
MIC 4:7 Aga m eme ka ndị ngwụrọ ahụ ghọọ ndị fọdụrụ ndụ, meekwaa ka ndị ahụ a chụpụrụ achụpụ ghọọ mba dị ike. Onyenwe anyị ga-esi nʼugwu Zayọn chịa ha site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.
MIC 4:8 Ma gị, ebe nche e wuliri elu maka igwe atụrụ, ugwu nke nwaada Zayọn, ọchịchị a na-achị na mbụ ga-adịghachikwara gị; bụ ọchịchị nke dịrị nwaada Jerusalem.”
MIC 4:9 Gịnị mere i ji na-akwasị akwa ike? Ọ bụ na i nweghị eze? Onye ndụmọdụ gị ọ nwụọla nke mere na ihe ụfụ jidere gị dịka nwanyị ime na-eme?
MIC 4:10 Susie ude ike, gị nwaada Zayọn, dịka ịsụ ude nke nwanyị ime na-eme, nʼihi na unu aghaghị ịhapụ obodo a jee biri nʼọhịa. Unu aghaghị ịga Babilọn, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka a ga-esi napụta unu. Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-agbapụta unu site nʼaka ndị iro unu.
MIC 4:11 Ugbu a, ọtụtụ mba ezukọọla imegide gị; na-asị, “Ka e merụọ ya ka anya anyị ṅụọ Zayọn.”
MIC 4:12 Ma ha amaghị ihe bụ uche Onyenwe anyị, ha aghọtakwaghị nzube ya, na ọ chịkọtala ha dịka ukwu ọka, na-ebuga ha nʼebe ịzọcha ọka.
MIC 4:13 “Bilie, zọchaa, gị nwaada Zayọn, nʼihi na aga m enye gị mpi igwe. Aga m enyekwa gị ụkwụ ọla bronz, ị ga-etijisikwa ọtụtụ mba. Uru ha niile, nke ha nwetara nʼụzọ na-ezighị ezi, ka ị ga-enye Onyenwe anyị. Akụnụba ha ka ị ga-enyekwa Chineke nwe ụwa niile.”
MIC 5:1 Ugbu a doo ndị agha gị nʼusoro, gị obodo nke usuu ndị agha, nʼihi na e jirila mgbidi gbaa gị gburugburu ibuso gị agha. Ha ga-eji mkpara tie onyendu Izrel na nti.
MIC 5:2 “Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata, ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile, ma onye ahụ ga-achị Izrel ga-esi na gị pụta, bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie, sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.”
MIC 5:3 Ya mere, a ga-arara ha nye tutu ruo mgbe onye ahụ ime na-eme mụpụtara nwa ya. Mgbe ahụ, ụmụnna ya niile ahụ fọdụrụ ga-alọghachikwuru ndị Izrel.
MIC 5:4 Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya, site nʼike nke Onyenwe anyị, na site nʼịdị ukwuu nke aha Onyenwe anyị Chineke ya. Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu, nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa.
MIC 5:5 Ọ ga-abụkwa udo anyị. Mgbe ndị Asịrịa ga-abata nʼala anyị nʼike, sikwa nʼebe niile e wusiri ike nke anyị na-agafe, anyị ga-ahọpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa, ọ bụladị ndịisi asatọ.
MIC 5:6 Onye ga-eji mma agha chịa ala Asịrịa, jirikwa mma agha a mịpụtara amịpụta chịa ala Nimrọd. Ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị Asịrịa ahụ, mgbe ha ga-eji ike bata nʼala anyị, ma zọrọkwa ije gafee oke ala anyị.
MIC 5:7 Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adị nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ, dịka igirigi si nʼebe Onyenwe anyị nọ abịa, maọbụ dịka mmiri ozuzo ntakịrị na-ezokwasị ahịhịa, nke na-adịghị ele anya mmadụ maọbụ chere ụmụ mmadụ.
MIC 5:8 Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ dị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche, e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ, nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga, ma o nweghị onye ga-anapụta ya.
MIC 5:9 Aka gị ga-adị elu na mmeri nke ndị iro ya, a ghakwaghị ịla ndị iro gị niile nʼiyi.
MIC 5:10 “Nʼụbọchị ahụ kwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m ala ịnyịnya unu nʼiyi site nʼetiti unu, kụjisiekwa ụgbọala unu niile.
MIC 5:11 Aga m ala obodo niile dị nʼala unu nʼiyi, dọdasịakwa ebe unu niile e wusiri ike.
MIC 5:12 Aga m ala mgbaasị unu nʼiyi, unu agaghị enwekwa ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase.
MIC 5:13 Aga m ala arụsị a pịrị apị unu niile nʼiyi, ya na nkume nsọ ahụ niile dị nʼetiti unu. Unu agakwaghị akpọ isiala nye ihe unu ji aka unu kpụọ.
MIC 5:14 Aga m ehopu ogidi arụsị niile nke dị nʼetiti unu, mgbe m ga-akụdasị obodo unu niile
MIC 5:15 Aga m esite nʼoke iwe m na ọnụma m bọọrọ onwe m ọbọ nʼahụ mba niile ndị ahụ jụrụ irubere m isi.”
MIC 6:1 Geenụ ntị nʼihe Onyenwe anyị na-ekwu, “Bilienụ ọtọ, ma kwuonụ nʼihu ugwu niile ụzọ m siri mejọọ unu. Ka ugwu nta niile nụkwa ihe i nwere ikwu.
MIC 6:2 “Ma ugbu a geenụ ntị, unu ugwu niile, geenụ ntị, unu ntọala ebighị ebi niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ikpe megide ndị nke ya. Ọ bụkwa Izrel ka ọ ga-arụso ụka.
MIC 6:3 “Unu bụ ndị m, gịnị ka m mere unu? Gwanụ m ụzọ m si boo unu ibu arọ? Zaanụ m.
MIC 6:4 Nʼihi na e si m nʼala Ijipt kpọpụta unu. Agbapụtara m unu site na ịbụ ohu, nye unu Mosis na Erọn na Miriam ka ha nyere unu aka.
MIC 6:5 Ndị m, chetanụ ihe Balak eze Moab zubere na ihe Belam nwa Beoa zara ya. Chetanụ njem unu site nʼobodo Shitim ruo obodo Gilgal, ka unu hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị.”
MIC 6:6 Gịnị ka m ga-eji bịa nʼihu Onyenwe anyị, ịkpọ isiala nʼihu Chineke onye dị oke elu? M ga-eji onyinye aja nsure ọkụ bịa nʼihu ya nke e ji ụmụ ehi gbara otu afọ chụọ?
MIC 6:7 Ọ ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, bụ ọtụtụ puku ebule, ya na iri puku mmanụ na-asọ dịka iyi? Aga m eji nwa mbụ m chụọ aja njehie m, maọbụ mkpụrụ nke ahụ m chụọ aja maka mmehie nke mkpụrụobi m?
MIC 6:8 Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma. Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị, Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya, na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije?
MIC 6:9 Gee ntị! Olu Onyenwe anyị na-ada na-akpọku ndị obodo ahụ, nʼezie, ịtụ egwu gị bụ inwe amamihe. “Nụrụnụ olu mkpanaka na Onye hiwere ya.
MIC 6:10 Ọ ga-abụ na m ga-echezọ akụ ị kpara nʼụzọ na-ezighị ezi, gị ụlọ ajọ omume, ya na ihe ọtụtụ nke na-erughị eru unu ji ere ahịa, bụ nke abụrụ ọnụ?
MIC 6:11 M ga-asị onye na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ azụ ahịa, na onye bu akpa nke ihe ọtụtụ aghụghọ dị iche iche juru nʼime ya na aka ya dị ọcha?
MIC 6:12 Ndị ọgaranya unu bụ ndị na-eme ihe ike, ndị mmadụ nọ nʼime gị na-agha ụgha, ire ha na-ekwu naanị okwu aghụghọ.
MIC 6:13 Nʼihi ya, ebidola m ịla unu nʼiyi, na ime ka unu bụrụ ndị e bibiri nʼihi mmehie unu
MIC 6:14 Unu ga-eri nri ma afọ agaghị eju unu; afọ agaghị ejukwa unu eju. Unu ga-ewezuga ihe, ma unu agaghị echekwa ha, nʼihi na ihe ọbụla unu nwere ike chekwaa, ka m ga-ewere nyefee nʼaka mma agha.
MIC 6:15 Unu ga-akụ mkpụrụ, ma unu agaghị ewe ihe ubi, unu ga-azọchapụta mmanụ oliv, ma unu agaghị ete ya nʼahụ unu; unu ga-azọchapụtakwa mmanya site na mkpụrụ vaịnị, ma unu agaghị aṅụ mmanya ya.
MIC 6:16 Unu edebela ụkpụrụ niile bụ nke Omri, na omenaala niile nke ụlọ Ehab, unu gbasokwara ndụmọdụ ha niile. Nʼihi ya, aga m enyefe unu nʼaka mbibi mee ka ndị gị ghọọkwa ihe ọchị, unu ga-aghọkwara mba niile ihe nkọcha.”
MIC 7:1 Ahụhụ dịrị m! Adị m ka onye na-achịkọta mkpụrụ osisi vaịnị nʼọkọchị, mgbe a ghọkọtachara mkpụrụ dị nʼubi vaịnị. O nweghị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ọbụla fọdụrụ nke e nwere ike ịta, o nwekwaghị mkpụrụ fiig buru ụzọ chaa nke agụ ya na-agụsị m ike
MIC 7:2 Ndị ezi omume agwụla nʼụwa, ọ dịkwaghị otu onye na-eme ihe ziri ezi fọdụrụ. Ha niile na-echere oghere ịkwafu ọbara, ha ji ụgbụ na-achụta nta, onye ọbụla na-achụ ụmụnne ya.
MIC 7:3 Ọrụ nke aka ha abụọ na-arụpụta nke ọma bụ ajọ omume. Onyeisi na-ana onyinye, onye ọkaikpe na-eri ngarị, ndị dị ike na-atụpụta ihe masịrị ha, si otu a na-akpagbu eziokwu.
MIC 7:4 Onye nke kachasị ibe ya ịdị mma nʼime ha dịka uke. Onye nke na-eme ihe ziri ezi nʼime ha jọrọ njọ karịa ogige ogwu. Ma ugbu a, ụbọchị Chineke na-eleta gị abịala, ụbọchị ahụ ndị nche gị na-akụ ekwe ịdọ aka na ntị. Ugbu a bụ oge ihe ịgba gharịị nye ha.
MIC 7:5 Ekwenyerela onye agbataobi gị, atụkwasịla onye bụ ezi enyi gị obi. Kpachara anya gị, nʼihe gbasara okwu ọnụ gị, ọbụla dị nʼebe nwunye gị nọ.
MIC 7:6 Nʼihi na nwa na-elelị nna ya anya. Nwa nwanyị na-ebili megide nne ya. Nwunye nwa megidekwa nne di ya, ndị iro mmadụ bụ ndị ezinaụlọ ya.
MIC 7:7 Ma mụ onwe m, ana m ele Onyenwe anyị anya nʼihi inyeaka ya. Eji m olileanya na-echere Chineke Onye nzọpụta m. Chineke m ga-anụ olu m.
MIC 7:8 Achịkwala m ọchị gị onye iro m. Mgbe m dara, aga m ebilitekwa. Mgbe m nọ nʼime ọchịchịrị, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abụ ihe m.
MIC 7:9 Nʼihi na m emehiela megide ya, aga m anabatara onwe m ahụhụ nke ọnụma Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ ga-ekpe ikpe m, mee ka m guzosie ike. Ọ ga-akpọpụta m nʼìhè; aga m elekwasịkwa ezi omume ya anya.
MIC 7:10 Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ, ihere ga-ekpuchi onye ahụ sịrị m, “Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.” Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada, ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ, dịka apịtị dị nʼokporoụzọ.
MIC 7:11 Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa; ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara.
MIC 7:12 Nʼụbọchị ahụ, ha ga-abịakwute gị, site na Asịrịa ruo na obodo niile nke Ijipt, sitekwa nʼIjipt ruo Yufretis, site nʼosimiri ruo osimiri, sitekwa nʼugwu ruo nʼugwu.
MIC 7:13 Ma ụwa ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼihi ndị bi nʼime ya, iji kwụọ ha ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere.
MIC 7:14 Were mkpanaka gị zụọ ndị gị, bụ igwe ewu na atụrụ nke ihe nketa gị, ndị bi naanị ha nʼoke ọhịa, nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ jupụtara. Kwere ka ha taa ahịhịa ndụ nke Bashan, na nke Gilead, dịka na mgbe ochie.
MIC 7:15 “Dịka nʼụbọchị ahụ unu sitere nʼIjipt pụta, aga m egosi ha ọrụ ịtụnanya m niile.”
MIC 7:16 Mba dị iche iche ga-ahụ ya, ihere ga-emekwa ha, nʼime ịdị ike ha niile. Ha ga-ekpuchi aka nʼọnụ ha, ntị ga-echikwa ha.
MIC 7:17 Ha ga-aracha aja dịka agwọ, na dịka anụ dị iche iche, nke na-akpụ akpụ nʼala. Ha ga-eji ịma jijiji si nʼebe ha e wusiri ike pụta. Nʼihi egwu ha, ha ga-abịakwute Onyenwe anyị bụ Chineke anyị. Ha ga-atụkwa egwu gị.
MIC 7:18 Onye bụ chi ahụ dịka gị, nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị? Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere.
MIC 7:19 Ọ ga-emekwara anyị ebere ọzọ. Ọ ga-azọdakwa mmehie anyị nʼokpuru ukwu ya, Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile nʼebe dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.
MIC 7:20 Ị ga-egosi Jekọb ntụkwasị obi, gosikwa Ebraham ịhụnanya gị, dịka ị ṅụọrọ nna nna anyị ha nʼiyi, site na mgbe ochie.
NAH 1:1 Amụma banyere obodo Ninive. Akwụkwọ ọhụ Nehum, onye obodo Elkosh.
NAH 1:2 Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ. Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi. Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya, oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya.
NAH 1:3 Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ. Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe, igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya.
NAH 1:4 Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa, o mekwaala ka osimiri niile takọrọ. Bashan na Kamel na-akpọnwụ, otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị.
NAH 1:5 Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ, ugwu nta niile na-agbazekwa, elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya, ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya.
NAH 1:6 Onye ga-eguzogide oke iwe ya? Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ? A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ, e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya.
NAH 1:7 Onyenwe anyị dị mma. Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu. Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,
NAH 1:8 ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu gbuo ndị iro ya niile, ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị.
NAH 1:9 Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyị ọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe; nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ.
NAH 1:10 Ha ga-abụ ndị a tụhịkọtara nʼetiti ogwu, ndị mmanya ha ṅụbigara oke na-egbu, ha ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
NAH 1:11 Ọ bụ nʼime gị, Ninive, ka otu onye si pụta, bụ onye ahụ gbara izu ọjọọ megide Onyenwe anyị, na-echepụtakwa ajọ atụmatụ.
NAH 1:12 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ ezie na ha siri ike, ma bakwaa ụba nʼọnụọgụgụ, ha ga-abụ ndị a ga-egbutu na ndị ga-agabiga. Ọ bụ ezie na m ataala gị bụ Juda ahụhụ, ma agaghị m atakwa gị ahụhụ ọzọ.
NAH 1:13 Ugbu a, aga m agbajipụ agbụ yoku ọ nyanyere unu nʼolu, tibikwaa ụdọ igwe e jiri kegide unu.”
NAH 1:14 Onyenwe anyị enyela iwu ya banyere gị, Ninive: “Ị gaghị enwekwa ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị. Aga m ala arụsị unu niile a pịrị apị na ndị a kpụrụ akpụ nʼiyi, bụ arụsị ndị ahụ dị nʼụlọnsọ nke chi unu niile. Aga m akwadokwa ili gị, nʼihi na ị bụrụla onye jọgburu onwe ya na njọ.”
NAH 1:15 Lee, nʼelu ugwu niile ka ụkwụ onye ahụ na-eweta oziọma dị, bụ onye ahụ na-ekwusa na udo ga-adị! Mee mmemme gị niile gị Juda, mezukwaa nkwa niile i kwere. Nʼihi na ndị ajọ omume agakwaghị ebuso gị agha, nʼihi na a ga-ala ha nʼiyi kpamkpam.
NAH 2:1 Onye na-ebuso gị agha na-abịakwasị gị. Chee ebe gị niile e wusiri ike nche. Chee ụzọ niile nche, mee ka ụkwụ gị sie ike nʼala. Chịkọtakwa ike gị niile.
NAH 2:2 Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi, dịka ịma mma nke Izrel ọ bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha, lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi.
NAH 2:3 Ọta ndị agha ya na-acha ọbara ọbara, ndị bụ dike nʼagha yikwa uwe na-acha uhie uhie. Igwe e ji wuo ụgbọ agha na-egbu amụma nʼụbọchị ahụ ha na-ejikere agha, otu a kwa, ha na-efegharịkwa ùbe ha eji osisi fịa mee.
NAH 2:4 Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi, ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile. Ha na-enwu dịka ire ọkụ, na-agbagharịkwa dịka amụma.
NAH 2:5 Ọ na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi, ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha. Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha, dozie ọta nche ha niile nʼusoro.
NAH 2:6 Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri, ụlọeze na-amakwa jijiji.
NAH 2:7 E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha. Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru, na-etikwa aka nʼobi.
NAH 2:8 Ninive dịka ọdọ mmiri nke mmiri ya na-ehifusị. “Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.
NAH 2:9 Kwakọrọnụ ọlaọcha, kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha. Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ, enweghị ọgwụgwụ.
NAH 2:10 E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji, anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.
NAH 2:11 Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a, bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri, ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị, na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla?
NAH 2:12 Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya, nke na-anyagburu nne ọdụm anụ, na-ekpoju anụ ọ dọgbutara nʼụlọ ya niile. Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ ọ dọgburu.
NAH 2:13 “Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, “Aga m esure ụgbọala gị niile nʼanwụrụ ọkụ, mma agha ga-ala ụmụ ọdụm gị niile nʼiyi. Agaghị m ahapụkwara gị anụ ọbụla ị ga-adọgbu nʼụwa. A gaghị anụkwa olu ndị ozi gị ọzọ.”
NAH 3:1 Ahụhụ dịrị obodo ọbara, nke jupụtara nʼụgha, na ihe e zutere nʼohi. Ọ dịghị mgbe ị na-adịghị adọgbu.
NAH 3:2 Ụda ụtarị, ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya, ikiri ụkwụ ịnyịnya na-agba ọsọ, na mkpọtụ nke ụgbọ ịnyịnya agha!
NAH 3:3 Ndị agha ịnyịnya, na-agbagharị na-efegharị mma agha na-egbu amụma, na ùbe ha na-egbuke egbuke. Ndị e gburu egbu dị ọtụtụ, ntụkọta ozu tọgbọrọ ebe niile, ozu a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị mmadụ na-asọ ngọngọ mgbe ha na-azọkwasị ozu ụkwụ na-agafe.
NAH 3:4 Ihe ndị a mere nʼihi enweghị afọ ojuju nke agụụ nke onye na-akwa iko, onye ji mma ile anya, nwanyị nwe mgbaasị dị iche iche, onye ji mba dị iche iche nʼagbụ site nʼịgba akwụna ya, na ọtụtụ mmadụ dị iche iche site na mgbaasị ya.
NAH 3:5 “Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. “Aga m ekpughepụ uwe gị, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gosi mba niile nke ụwa ọtọ gị. Ihere ga-emekwa gị nʼihu alaeze niile.
NAH 3:6 Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche, meso gị mmeso onye e ledara anya, mekwaa ka ị bụrụ ihe ilere anya nye mmadụ niile.
NAH 3:7 Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị, ‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’ Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?”
NAH 3:8 Ị dị mma karịa Tibs, bụ obodo dị nʼọnụ mmiri Naịl, nke mmiri gbara gburugburu? Osimiri ahụ bụ ihe o ji echebe onwe ya, mmiri ahụ bụkwa mgbidi gbara ya gburugburu.
NAH 3:9 Kush na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ, Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya.
NAH 3:10 Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọ dịka ohu a dọtara nʼagha. A tụpịasịrị ụmụ ya a mụrụ ọhụrụ nʼelu nkume, nke dị nʼisi okporoụzọ ya niile. E fekwara nza iji kesaa ndị ya niile a na-asọpụrụ, e kekwara ndị ukwu ya niile mkpọrọ igwe.
NAH 3:11 Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke, ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo, ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị.
NAH 3:12 Ebe gị niile e wusiri ike dịka osisi fiig nke mkpụrụ mbụ ya chara nʼelu ya. Ma mgbe a kwagharịrị ya mkpụrụ ndị ahụ na-adaba nʼọnụ onye na-eri ya.
NAH 3:13 Lee ndị agha gị, ha niile bụ ụmụ nwanyị nʼetiti gị. E megheela ọnụ ụzọ ama nke ala gị niile nye ndị iro gị. Ọkụ erepịakwala na mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ unu niile.
NAH 3:14 Seta mmiri maka oge nnọchibido, mee ka ebe gị niile nke ewusiri ike siekwa ike karịa. Gwupụta ụrọ, zọta aja, jiri ụrọ ndị ahụ kpụtakwa aja, rụzikwaa ụlọ ahụ.
NAH 3:15 Nʼebe ahụ ka ọkụ ga-erechapụ gị, mma agha ga-egbutu gị. Ọ ga-eripịa gị dịka igurube si erichapụ ihe niile dị ya nʼihu. Ọ bụladị ma i mee onwe gị ka i hie nne dịka ụkpana, maọbụ mụbaa dịka igurube.
NAH 3:16 Ị meela ka ndị ahịa gị mụbaa nʼọnụọgụgụ, baa ụba karịa kpakpando dị nʼeluigwe, dịka igurube ha na-eripịa ala ahụ, gbasaa nku ha efelaga
NAH 3:17 Ndị nche gị bara ụba igurube, ndị ode akwụkwọ gị dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka igwe igurube na-ebekwasị nʼelu mgbidi nʼụbọchị oyi. Ma mgbe anyanwụ wara, ha na-efelaga; ọ dịkwaghị onye maara ebe ha feere gaa.
NAH 3:18 Eze ndị Asịrịa, ndị ọzụzụ atụrụ gị na-ero ụra, ndị unu a na-asọpụrụ adaala nʼụra ọnwụ. Ndị gị niile agbasasịala nʼelu ugwu niile, ọ dịkwaghị onye ha nwere nke ga-achịkọta ha.
NAH 3:19 Ọ dịghị ihe nwere ike ime ka i si nʼọnọdụ ị nọ ugbu a biliekwa. Nʼihi na ọnya dị gị nʼahụ ga-egbu gị. Ndị niile nụrụ ihe dakwasịrị gị ga-eji ọṅụ kụọ aka ha, nʼihi na onye ka mmadụ ahụ bụ nke na-anụrụghị ụfụ nke enweghị obi ebere gị?
HAB 1:1 Nke a bụ ozi Habakuk onye amụma natara.
HAB 1:2 Onyenwe anyị, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpu ma ị dịghị ege ntị? Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku gị na-asị, “Ihe ike, ihe ike!” ma ị dịghị azọpụta?
HAB 1:3 Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ? Gịnị mere i ji anagide mmegbu? Mbibi na ihe ike dị nʼihu m, na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile.
HAB 1:4 Nʼihi ya, iwu na-ada mba, ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu. Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu, nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ.
HAB 1:5 “Legide mba niile anya, ka i hụ. Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu. Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu, nke unu na-agaghị ekwenye, ọ bụladị ma akọọrọ unu ya.
HAB 1:6 Nʼihi na lee, agaje m ime ka ndị Kaldịa bilie, bụ mba ahụ na-adịghị eme ebere, na ndị na-eme ngwangwa. Ha bụ ndị na-ebu agha na-ejegharị na mba niile, ndị na-esite nʼaka ike na-enweta ebe obibi nke na-abụghị nke ha.
HAB 1:7 Ha bụ mba a na-atụ ụjọ, na ndị dịkwa egwu. Ha bụ iwu nye onwe ha, ihe ha tụpụtara ka ha na-eme. Ọ bụ onwe ha ka ha na-ebuli elu.
HAB 1:8 Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ. Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị. Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ, ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa. Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri.
HAB 1:9 Ha niile na-abịa ime ihe ike. Ha ji ọsọ na-abịa dịka oke ifufe nke ọzara. Ha na-abịa ịchịkọta ndị a dọtara nʼagha dịka ha bụ uzuzu.
HAB 1:10 Ha na-akwa ndị eze emo, jirikwa ndịisi ọchịchị na-eme ihe ọchị. Ha na-achị ebe niile e wusiri ike ọchị, na-ekpokọtakwa aja nʼazụ mgbidi niile ịlụta ha nʼagha.
HAB 1:11 Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwa ndị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.”
HAB 1:12 Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi? Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ. Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe. Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ.
HAB 1:13 Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya; ị naghị anabatakwa mmegbu. Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị? Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda ndị bụ ndị ezi omume karịa ha?
HAB 1:14 I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri, e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha.
HAB 1:15 Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha. Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha. Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya, si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ.
HAB 1:16 Nʼihi nke a, ọ na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya, nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ, na-erikwa nri kachasị mma
HAB 1:17 Ọ ga-aga nʼihu mgbe niile na-awụpụ ihe o ji ụgbụ ya gbute na-ala mba niile nʼiyi, dịka o si masị ya, na-egosighị obi ebere ọbụla?
HAB 2:1 Aga m arịgoro nʼelu ebe nche m, guzo onwe m nʼebe nchekwa ahụ. Aga m echerekwa ịhụ ihe ọ ga-agwa m, na ihe m ga-asa, banyere mkpesa ndị a.
HAB 2:2 Mgbe ahụ Onyenwe anyị zara m sị, “Dee ọhụ ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe. Depụta ya nke ọma, ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya.
HAB 2:3 Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka, ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ, Ọ gaghị abụkwa ụgha. Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya, nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo, ọ gaghị anọ tee aka.
HAB 2:4 “Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu; ọchịchọ ya ezikwaghị ezi ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe ya dị ndụ.
HAB 2:5 Nʼezie, mmanya na-eduhie ya ụzọ, onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike. Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ, ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ. Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya, ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha.
HAB 2:6 “Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya, “ ‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi, ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’
HAB 2:7 Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede? Ọ bụ na ha agaghị eteta nʼụra, mee gị ka ị maa jijiji? Mgbe ahụ ka ha ga-eji gị mee ihe ha chọrọ.
HAB 2:8 Nʼihi na ị kwakọtala akụ nke ọtụtụ mba dị iche iche, ndị ahụ fọdụrụ ga-abịakwa kwakọrọ ihe niile i nwere. Nʼihi na ị wụsịala ọbara ndị mmadụ, i bibiela ọtụtụ ala na obodo na ndị niile bi nʼime ha.
HAB 2:9 “Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ, nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu, nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa.
HAB 2:10 I sitela nʼizuzu ọjọọ gị mee ka mbibi bịakwasị ọtụtụ mmadụ, sị otu a tufuo ndụ gị, ma wetakwara ezinaụlọ gị ihere.
HAB 2:11 Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị. Osisi e ji doo elu ụlọ ga-etikwa mkpu akwa za nkume ndị ahụ.
HAB 2:12 “Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo, nke na-ejikwa ajọ omume eme ka obodo ahụ guzosie ike.
HAB 2:13 Ọ bụ na ọ bụghị uche Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ, na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi?
HAB 2:14 Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị, dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
HAB 2:15 “Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya, nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, ka o si otu a hụ ọtọ ya anya.
HAB 2:16 Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị. Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị.
HAB 2:17 Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị. Mbibi i bibiri anụmanụ dị iche iche ga-emekwa ka egwu ju gị obi. Nʼihi na ị wụsịala ọbara ọtụtụ mmadụ, bibie ala na obodo dị iche iche, bibiekwa ndị niile bi nʼime ha.
HAB 2:18 “Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya? Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha? Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara, nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere.
HAB 2:19 Ahụhụ dịrị onye ahụ na-agwa osisi okwu sị, ‘Dịrị ndụ.’ Ma ọ bụ nkume nke na-apụghị ikwu okwu, ‘Teta nʼụra.’ O nwere ike izi mmadụ ihe? Lee, ọ bụ ihe eji ọlaọcha na ọlaedo machie, ma ọ dịghị nkuume ọbụla dị nʼime ya.”
HAB 2:20 Ma Onyenwe anyị nọ nʼime ụlọnsọ ukwu ya. Ya mere, ka ụwa niile dere duu nʼihu ya.
HAB 3:1 Nke a bụ ekpere Habakuk onye amụma kpere. Ọ dị nʼusoro Shiginot. Nke a bụ ihe o kwuru.
HAB 3:2 Onyenwe anyị anụla m ihe niile e kwuru banyere ude gị. Ịdị ukwuu nke ọrụ gị niile na-emekwa ka m dere duu nʼegwu nʼihu gị, Onyenwe anyị. Mekwaa ya ọzọ nʼoge nke anyị, mekwaa ka anụ akụkọ ya nʼọgbọ anyị. Nʼoke iwe gị chetakwa ebere.
HAB 3:3 Chineke si na Teman bịa, Onye Nsọ ahụ sikwa nʼugwu Paran. Sela Ebube ya na-ekpuchi eluigwe, otuto ya jupụtakwara nʼụwa.
HAB 3:4 Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ, ihe na-enwupụta site nʼaka ya, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya.
HAB 3:5 Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga, oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ.
HAB 3:6 O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa; o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji. Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara, ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara. Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
HAB 3:7 Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ, na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ.
HAB 3:8 Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide? Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile? Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị, nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri?
HAB 3:9 I kpughepụrụ ụta gị, kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ. Sela I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa.
HAB 3:10 Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha. Oke mmiri ozuzo gabigakwara. Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda, buliekwa ebili mmiri elu.
HAB 3:11 Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe, mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị, mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu.
HAB 3:12 I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa, sitekwa nʼiwe gị zọchaa mba dị iche iche dịka ọka.
HAB 3:13 Ị pụtara ịzọpụta ndị gị, ịzọpụta onye ahụ i tere mmanụ. Ị zọpịara isi onyendu nke ala ajọ omume ahụ, gbawa ya ọtọ site nʼisi ruo nʼụkwụ.
HAB 3:14 Ọ bụ ùbe ya ka i ji mawaa ya isi, mgbe ndị dike nʼagha ya bịara dịka oke ifufe ịchụsa anyị, mgbe ha si nʼobi ụtọ ha chee na ha na-aga iripịa ndị ogbenye e wedara nʼala, bụ ndị na-ezo onwe ha.
HAB 3:15 Ị chịrịla ịnyịnya gị zọọ ije nʼoke osimiri, kpagharịa mmiri ukwu ndị ahụ.
HAB 3:16 Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile, egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu, ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure, mee ka ụkwụ m maa jijiji. Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha.
HAB 3:17 A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru, na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị, a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri, a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ, na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,
HAB 3:18 mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m.
HAB 3:19 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ ike m, ọ na-eme ụkwụ m abụọ ka ha dịka nke ele. Ọ na-emekwa ka m zọọ ije nʼebe niile dị elu. Nke a dịrị onyeisi abụ, nʼụbọ akwara m dị iche iche.
ZEP 1:1 Okwu Onyenwe anyị nke rutere Zefanaya, nwa Kushi, nwa nwa Gedaliya, bụ nwa Amaraya. Amaraya bụ nwa Hezekaya. Ozi a bịara nʼoge Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda.
ZEP 1:2 “Aga m azachapụ ihe niile site nʼelu ụwa,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
ZEP 1:3 “Aga m azachapụ mmadụ na anụmanụ. Aga m azachapụ ụmụ anụ ufe niile nke dị nʼeluigwe, zachapụkwa azụ niile nke dị nʼosimiri, na arụsị niile dị iche iche nke na-eme ka ndị ajọ mmadụ sụọ ngọngọ.” “Mgbe m kpochapụrụ mmadụ niile site nʼelu ụwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
ZEP 1:4 “Aga m esetipụ aka m megide Juda, megidekwa ndị niile bi na Jerusalem. Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a, na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị,
ZEP 1:5 bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando, ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi, ma na-ejikwa Milkọm na-aṅụ iyi,
ZEP 1:6 na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.”
ZEP 1:7 Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso. Onyenwe anyị ejikerela ịchụ aja; o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ.
ZEP 1:8 “Nʼụbọchị ịchụ aja nke Onyenwe anyị ahụ, aga m ata ndịisi niile na ụmụ eze niile, na ndị niile na-eyi uwe e si na mba ọzọ bubata ahụhụ.
ZEP 1:9 Nʼụbọchị ahụ, aga m ata ha ahụhụ bụ ndị niile na-adịghị azọ ụkwụ nʼọnụ ụzọ mbata, ndị ji ihe ike na aghụghọ na-emejupụta ụlọ arụsị ha.
ZEP 1:10 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “olu iti mkpu akwa ga-esite nʼỌnụ Ụzọ Ama Azụ daa, mkpu nke ịkwasi akwa ike ga-ada site nʼebe obibi ọhụrụ ahụ, na ụzụ oke ntiwa site nʼugwu nta niile.
ZEP 1:11 Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị; nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile. Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi.
ZEP 1:12 Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem. Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ, bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ, ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị, maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’
ZEP 1:13 Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike, a ga-akwatukwa ụlọ ha niile. Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ, ma ha agaghị ebi nʼime ha; ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị, ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.”
ZEP 1:14 Oke ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa nso, ọ na-abịakwa ọsịịsọ. Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị Onyenwe anyị ga-adị ilu nke ukwuu. A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ.
ZEP 1:15 Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nsogbu na mbibi, ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ, ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị,
ZEP 1:16 ụbọchị opi ike na iti mkpu agha imegide obodo niile e wusiri ike, na imegide akụkụ ụlọ elu niile.
ZEP 1:17 “Aga m eme ka oke nhụju anya bịakwasị ndị mmadụ, mee ka ha jegharịa dịka ndị kpuru ìsì, nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị. A ga-awụsịkwa ọbara ha dịka uzuzu, tufukwaa anụ ahụ ha dịka nsị anụ.
ZEP 1:18 Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị azọpụta ha nʼụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị ahụ.” A ga-erechapụ ụwa niile site nʼọkụ ekworo ya, nʼihi na ọ bụ na mberede ka ọ ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.
ZEP 2:1 Chịkọtaanụ onwe unu, e, chịkọtaanụ onwe unu, unu ndị mba ihe ihere dịrị.
ZEP 2:2 Tupu ụkpụrụ ahụ ewere ọnọdụ, a chịpụ ụbọchị ahụ dịka igbugbo ọka nke ikuku na-ebufu, tupu iwe ọkụ Onyenwe anyị abịakwasị gị, tupu ụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị abịakwasị gị.
ZEP 2:3 Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ, unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu. Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi, ma eleghị anya, a ga-echebe unu nʼụbọchị iwe Onyenwe anyị.
ZEP 2:4 Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza, obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu. Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd; a ga-ehopukwa Ekrọn.
ZEP 2:5 Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri, unu bụ ndị Keret; okwu Onyenwe anyị na-emegide unu, Kenan, ala ndị Filistia. Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi, ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.”
ZEP 2:6 Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ, ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ na ọgba igwe ewu na atụrụ.
ZEP 2:7 Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na Juda, ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa. Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị Ashkelọn nke tọgbọrọ nʼefu, dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi. Onyenwe anyị Chineke ha ga-elekọta ha, mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile.
ZEP 2:8 “Anụla m okwu ọjọọ niile, nke ndị Moab, na ịkwa emo niile nke ndị Amọn, nụkwa ịbasị mba ike ha megide ndị nke m na-anya isi na ha ga-ewere ala ha.
ZEP 2:9 Nʼihi ya, dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwubiri ya, “aghaghị m ime ka Moab dịrị ka Sọdọm, mekwaa ka Amọn dịka Gọmọra. Ha ga-aghọ ala ebe ahịhịa na-adụ ogwu ogwu na-eru, ebe olulu nnu jupụtara, na ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. Ndị m, ndị fọdụrụ ga-akwakọrọ akụnụba ha, ndị fọdụrụ ndụ na mba m ga-eketa ala ha.”
ZEP 2:10 Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha, na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
ZEP 2:11 Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ, mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi. Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya, onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile.
ZEP 2:12 “Unu ndị Itiopia, a ghaghị iji mma agha gbuo unu.”
ZEP 2:13 Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu, laa Asịrịa nʼiyi. Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.
ZEP 2:14 Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ, ha na ihe e kere eke dị iche iche. Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ. Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku, mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile, ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe.
ZEP 2:15 Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri, nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla; nke na-asị onwe ya, “Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m.” Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu; lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi. Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ, ma fufekwaa isi ya.
ZEP 3:1 Ahụhụ dịrị obodo ahụ ndị mmegbu, na ndị na-enupu isi, na ndị rụrụ arụ jupụtara nʼime ya.
ZEP 3:2 Ọ naghị ege onye ọbụla ntị, ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị. Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi, ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso.
ZEP 3:3 Ndịisi nọ nʼetiti ya dịka ọdụm na-agbọ ụja, ndị ọkaikpe ya dịka nkịta ọhịa na-achụ nta anyasị, nke ihe ọ chụtara na nta adịghị anọ tutu chi abọọ.
ZEP 3:4 Ndị amụma ya bụ ndị ndu rụrụ arụ, ha bụkwa ndị aghụghọ. Ndị nchụaja ya na-emerụ ebe nsọ na-ejikwa ike emebi iwu.
ZEP 3:5 Ma Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume. Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ. Ụtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè; ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya, ma ndị ajọ omume enweghị ihere.
ZEP 3:6 “Egbuchapụla m mba niile dị iche iche, kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike. Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ, ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga. A laala obodo ha niile nʼiyi, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye.
ZEP 3:7 Asịrị m, banyere Jerusalem, ‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m, ma nabatakwa ntụziaka.’ Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya, ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya. Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere.
ZEP 3:8 Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe. Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche, na ịkpọkọta alaeze niile, ịwụkwasị ha oke iwe m, ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m. Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m, ka a ga-eji rechapụ ụwa niile.
ZEP 3:9 “Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha, ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị, ma jikọta aka fekwaa ya ofufe.
ZEP 3:10 Site nʼofe osimiri niile nke Kush, bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m, ga-ewetara m onyinye dị iche iche.
ZEP 3:11 Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị, nʼihi omume njehie niile i jere megide m, nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niile na-aṅụrị ọṅụ na mpako ha. A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elu nʼugwu nsọ m.
ZEP 3:12 Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi, na ndị dị umeala nʼobi fọdụ nʼetiti ndị Izrel, ha ga-agbabakwa nʼaha Onyenwe anyị.
ZEP 3:13 Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ, ha agaghị ekwu okwu ụgha. Ire na-ekwu okwu aghụghọ agaghị adịkwa nʼọnụ ha. Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.”
ZEP 3:14 Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem.
ZEP 3:15 Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ.
ZEP 3:16 Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ, “Atụla egwu, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba.
ZEP 3:17 Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba, kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.”
ZEP 3:18 “Nʼụbọchị mmemme a kara aka, aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ, nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị.
ZEP 3:19 Nʼoge ahụ, aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike. Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ, chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ. Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere.
ZEP 3:20 Nʼoge ahụ, aga m akpọlata unu nʼụlọ; mgbe m ga-akpọkọta unu ọnụ. Aga m eme ka unu na-ewu ewu ka unu nwekwaa otuto nʼetiti mmadụ niile bi nʼụwa, mgbe m ga-eweghachi ihe ọma unu nʼihu anya unu.” Ka Onyenwe anyị kwuru.
HAG 1:1 Ozi Onyenwe anyị, nke rutere Hegai onye amụma, nke o ziri Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja. Ozi a rutere ya nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, nʼụbọchị nke mbụ nʼọnwa nke isii.
HAG 1:2 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Ndị a na-asị, ‘Nʼoge ahụ erubeghị mgbe anyị ga-ewu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.’ ”
HAG 1:3 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịara site nʼọnụ Hegai, onye amụma na-asị,
HAG 1:4 “Nke a ọ bụ oge unu onwe unu ji ebi nʼụlọ unu e ji osisi machie, mgbe ụlọnsọ ukwu a nọgidere na-adakpọsị?”
HAG 1:5 Ugbu a, ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Lezienụ ụzọ unu anya.
HAG 1:6 Unu na-agha mkpụrụ, ma na-enweta naanị ihe ntakịrị. Unu na-eri nri, ma ihe unu na-eri adịghị ezuru unu. Unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu adịghị aṅụju afọ ka o si mmasị unu. Unu na-eyikwasị onwe unu uwe, ma ọ dịghị achụ unu oyi. Unu na-anata ụgwọ ọrụ, maọbụ nʼakpa puru epu ka unu na-etinye ya.”
HAG 1:7 Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Chezienụ echiche banyere ndụ unu.
HAG 1:8 Jeenụ nʼelu ugwu, wedata osisi, jiri ya wuo ụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe ahụ, obi ga-atọ m ụtọ na ya, a ga-asọpụkwara m nʼebe ahụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru.
HAG 1:9 “Unu na-ele anya ihe ukwu, ma lee, ọ bụ naanị ihe ntakịrị ka ọ pụtara. Mgbe unu welatara ha nʼụlọ, a fụfụsiri m ha niile. Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. “Ọ bụ nʼihi na ụlọnsọ ukwu m, nke nọgidere na-abụ mkpọmkpọ ebe, ma onye ọbụla nʼime unu na-agba mbọ ịrụ naanị ihe gbasara ụlọ nke aka ya.
HAG 1:10 Ya mere, nʼihi unu ka eluigwe ji jide igirigi ha, ala ejidekwala ihe omume nke ubi.
HAG 1:11 Akpọọla m ka okpomọkụ bịakwasị nʼala ubi niile nakwa nʼelu ugwu niile, nʼelu ọka na mmanya ọhụrụ, mmanụ oliv na ihe niile nke ala na-emepụta. Ka ọ bịakwasị mmadụ na anụmanụ niile, nakwa ihe niile unu dọgburu onwe unu nʼọrụ inweta.”
HAG 1:12 Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị niile fọdụrụ, ṅara ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke ha, na nʼozi Hegai onye amụma, dịka Onyenwe anyị Chineke ha zitere ya. Ndị Izrel niile tụkwara egwu Onyenwe anyị.
HAG 1:13 Mgbe ahụ Hegai, onyeozi Onyenwe anyị, ziri ndị mmadụ ahụ niile ozi Onyenwe anyị, sị: “Mụ onwe m nọnyeere unu,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
HAG 1:14 Ya mere, Onyenwe anyị kwaliri mmụọ Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na mmụọ Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja na mmụọ ndị niile ahụ fọdụrụ nʼala ahụ. Ha niile bịara bido ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke ha,
HAG 1:15 nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa nke isii. Ọ bụ nʼafọ nke abụọ, nke ọchịchị eze Daraiọs,
HAG 2:1 nʼụbọchị nke iri abụọ na otu, nʼọnwa nke asaa, okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ onye amụma Hegai bịakwa na-asị:
HAG 2:2 “Gwa Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị Izrel ahụ fọdụrụ nʼala ahụ sị:
HAG 2:3 ‘Onye nʼime unu nwere ike icheta otu ụlọnsọ ukwu nke mbụ si dị ebube? Ọ dị aṅaa nʼanya unu ugbu a? Ọ bụ na ọ dịghị unu ka ihe efu ugbu a.
HAG 2:4 Ma ugbu a nwee obi ike Zerubabel,’ ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Nwekwaa obi ike gị Joshua onyeisi nchụaja, nwa Jehozadak. Nwekwaanụ obi ike unu ndị niile bi nʼala a.’ Ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Rụọnụ ọrụ nʼihi na anọnyeere m unu,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
HAG 2:5 ‘Nke a bụ ihe merenụ mgbe mụ na unu gbara ndụ nʼoge ahụ unu si nʼIjipt pụta. Mmụọ m na-anọgidekwa nʼetiti unu. Unu atụla egwu.’
HAG 2:6 “Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa oge nta gasịa, aga m ayọgharị eluigwe na ụwa, na osimiri na ala akọrọ.
HAG 2:7 Aga m ayọgharịkwa mba niile; ihe mba niile na-achọsi ike ga-abịa. Aga m eme ka ụlọ a jupụta nʼebube,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
HAG 2:8 ‘Ọlaọcha niile na ọlaedo niile, bụ nke m.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
HAG 2:9 ‘Ebube nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube nke mbụ,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọ bụkwa nʼebe a ka m ga-enye ọganihu na udo,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”
HAG 2:10 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa itoolu, nke afọ abụọ, nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị bịakwutere onye amụma, bụ Hegai.
HAG 2:11 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Jụọ ndị nchụaja ihe iwu na-ekwu.
HAG 2:12 Ọ bụrụ na mmadụ etinye anụ e doro nsọ nʼakpa uwe ya, ọ bụrụkwa na uwe ahụ anụ nsọ ahụ dị nʼime ya emetụ achịcha, maọbụ ofe, maọbụ nri ọzọ dị iche, mmetụ uwe ahụ metụrụ ha ọ ga-eme ka ha dịrị nsọ?’ ” Ndị nchụaja zara sị: “Mba!”
HAG 2:13 Mgbe ahụ Hegai kwukwara, “Ọ bụrụ na mmadụ emerụọ onwe ya site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka, mesịa metụ otu nʼime ihe ndị a aka, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ?” Ndị nchụaja zara sị, “E, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ.”
HAG 2:14 Mgbe ahụ Hegai kwuru sị, “ ‘Otu a ka mba a na ndị bi nʼime ya dị nʼihu m. Ihe ọbụla aka ha rụpụtara na onyinye ọbụla ha nyere bụ ihe rụrụ arụ.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru.
HAG 2:15 “ ‘Ma ugbu a, chezienụ echiche banyere ihe ndị ga-emenụ site taa gaa nʼihu. Tuleenụ otu ihe si dị tupu adọnye otu nkume nʼelu ibe ya nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
HAG 2:16 Kedụ ọnọdụ unu? Mgbe mmadụ bịara nʼebe o debere ọtụtụ iri efere ọka abụọ, ihe ọ na-ahụ bụ naanị ọtụtụ efere ọka iri. Ọ bụrụkwa na ọ bịa nʼebe ịnara mmanya ka o were iri ite mmanya ise, ọ bụ naanị iri ite mmanya abụọ ka ọ ga-enweta.
HAG 2:17 Eji m ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu, na mkpụrụ mmiri igwe bibie ọrụ aka unu niile; ma unu alọghachikwuteghị m,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.
HAG 2:18 ‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, site nʼụbọchị taa bụ iri ụbọchị anọ nke ọnwa itoolu, chenụ echiche banyere ụbọchị a bụ ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Chezienụ echiche banyere ya.
HAG 2:19 Ọ ka nwere mkpụrụ ọghịgha unu nwere nʼọba unu? Ọzọkwa, osisi vaịnị, osisi fiig, osisi pomegranet na osisi oliv amịghị mkpụrụ, ruo ugbu a. “ ‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu aga m agọzi unu.’ ”
HAG 2:20 Okwu Onyenwe anyị bịakwutere Hegai nke ugboro abụọ, nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa ahụ, sị,
HAG 2:21 “Gwa Zerubabel, onye na-achị Juda sị ana m aga ịyọgharị eluigwe na ụwa.
HAG 2:22 Aga m akwatu ocheeze alaeze dị iche iche, ana m agakwa imebi ike alaeze nke mba dị iche iche. Aga m akwatu ụgbọ ịnyịnya nʼala na ndị na-anya ha; ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-adakwa. Onye ọbụla ga-adakwa site na mma agha nke onye otu ya.
HAG 2:23 “ ‘Nʼụbọchị ahụ,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, ‘Aga m ewere gị bụ onyeozi m Zerubabel nwa Shealtiel,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘mee gị ka ị dị ka mgbaaka akara m, nʼihi na ahọrọla m gị,’ Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.”
ZEC 1:1 Nʼọnwa nke asatọ, nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya nwa Berekaya, nwa Ido, bụ onye amụma ntị, na-asị,
ZEC 1:2 “Onyenwe anyị were oke iwe megide nna unu ha.
ZEC 1:3 Nʼihi ya, gwa ha, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu. ‘Lọghachikwutenụ m,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara, ‘Mụ onwe m kwa ga-alọghachikwute unu.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu.
ZEC 1:4 Unu adịla ka ndị nna unu ha, ndị amụma mbụ kpọrọ oku si, Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara: ‘Sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ajọ omume unu chigharịa’ ma ha achọghị ịnụ maọbụ gee m ntị, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
ZEC 1:5 Olee ebe ka nna nna unu ha nọ ugbu a? Ndị amụma ahụ, ha na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?
ZEC 1:6 Ọ bụ na okwu m na iwu bụ nke m nyere ụmụ ohu m ndị amụma, ọ bụ na ha emezughị nʼebe ndị nna nna unu ha nọ? “Mgbe ahụ, ha chegharịrị ma kwuo, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, emesola anyị mmeso dịka ụzọ anyị na omume anyị si dị. O mekwara ya dịka o si zube na ọ ga-eme ya.’ ”
ZEC 1:7 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nke ọnwa iri na otu, bụ ọnwa Shebat, nʼafọ abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya onye amụma, bụ nwa Berekaya, nwa Ido ntị, na-asị:
ZEC 1:8 Nʼabalị ahụ, ahụrụ m nʼọhụ, otu nwoke na-agba ịnyịnya na-acha ọbara ọbara. O guzokwa nʼetiti osisi mietul, nke dị nʼebe miri emi nke mgbawa dị nʼala. Nʼazụ ya, ọtụtụ ịnyịnya na-acha ọbara ọbara, ndị na-acha ka ahịhịa kpọrọ nkụ, na ndị na-acha ọcha dịkwa.
ZEC 1:9 Ajụrụ m, “Nna m ukwu, gịnị bụ ihe ndị a?” Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu sịrị m, “Aga m egosi gị ihe ha bụ.”
ZEC 1:10 Mgbe ahụ onye ahụ guzo nʼetiti osisi mietul ndị ahụ sịrị, “Ndị a bụ ndị Onyenwe anyị zitere ka ha jegharịa nʼụwa niile.”
ZEC 1:11 Ha sịrị mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nke na-eguzo nʼetiti osisi mietul ahụ, “Anyị ejegharịala nʼụwa niile, ma lee anyị chọpụtara na ụwa niile nọ nʼudo, dịkwa jụụ.”
ZEC 1:12 Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị sịrị, “Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide hapụ imere Jerusalem na obodo niile nke Juda ebere, bụ obodo ị na-eweso iwe iri afọ asaa ndị a gara aga?”
ZEC 1:13 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara mmụọ ozi ahụ guzo na-agwa m okwu, okwu nkasiobi na okwu ọma dị iche iche.
ZEC 1:14 Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nọ na-agwa m okwu gwara m sị, “Kwusaa ozi a, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru sị, ‘Ekworo m dị ukwuu nʼebe Jerusalem na Zayọn nọ,
ZEC 1:15 ma iwe m dị ukwuu megide ndị mba niile ahụ onwe ha juru afọ. Nʼihi na mgbe iwe m dị nta, ha nyere aka ime ka ahụhụ ahụ karịa njọ.’
ZEC 1:16 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eji obi ebere lọghachi na Jerusalem. Nʼebe ahụ kwa ka a ga-ewugharị ụlọnsọ ukwuu m. A ga-esetikwa eriri e ji atụ ihe nʼelu Jerusalem.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
ZEC 1:17 “Kwusaakwa ọzọ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọganihu ga-adịkwa nʼobodo m niile ọzọ.Onyenwe anyị ga-akasị Zayọn obi ọzọ, ma họpụtakwa Jerusalem.’ ”
ZEC 1:18 Mgbe ahụ, eweliri m anya m abụọ elu hụ mpi anọ.
ZEC 1:19 Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu sị, “Gịnị ka ihe ndị a bụ?” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ mpi ndị ahụ chụsasịrị Juda, na Izrel, na Jerusalem.”
ZEC 1:20 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri m ndị ọkpụ ụzụ anọ.
ZEC 1:21 Asịrị m, “Gịnị ka ndị na-abịa ime?” Ọ zaghachiri m, “Ndị a bụ mpi anọ ndị ahụ chụsasịrị Juda, ime ka onye ọbụla ghara inwe ike iwelite isi ya. Ma ndị a abịala imenye ha ụjọ, na ịtụda mpi mba niile, bụ ndị ahụ buliri mpi ha imegide ala Juda, na ịchụsa ndị ya.”
ZEC 2:1 Mgbe m weliri anya m, ahụrụ m otu nwoke ji eriri ihe ọtụtụ nʼaka ya.
ZEC 2:2 Ajụrụ m, “Ebee ka ị na-aga?” Ọ sịrị m, “Ana m aga ịtụ Jerusalem, ịchọta ịdị ogologo ya, na ịdị obosara ya.”
ZEC 2:3 Mgbe mmụọ ozi na-ekwuru m okwu na-apụ, mmụọ ozi ọzọ bịara izute ya,
ZEC 2:4 ọ sịrị ya, “Gbaa ọsọ, gwa nwa okorobịa ahụ, sị, ‘Obodo na-enweghị mgbidi ka Jerusalem ga-abụ, nʼihi ọtụtụ igwe mmadụ na anụmanụ ga-ejupụta nʼime ya.
ZEC 2:5 Ma mụ onwe m ga-abụrụ ya mgbidi ọkụ nke ga-agba ya gburugburu.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Aga m aghọ ebube nʼetiti ya.’
ZEC 2:6 “Bịa, lee anya! Sitenụ nʼala dị nʼugwu gbapụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “nʼihi na achụsasịrị m unu nye ikuku anọ nke eluigwe,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
ZEC 2:7 “Bịanụ, unu ndị bi na Zayọn. Gbalaganụ, unu ndị bi nʼala nke ada Babilọn.”
ZEC 2:8 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Mgbe Onye ahụ dị ebube zipụrụ m ịga megide mba ndị ahụ niile kwakọọrọ ihe unu. Nʼihi na onye ọbụla metụrụ unu aka bụ mkpụrụ anya m ka ọ na-emetụ aka.
ZEC 2:9 Aghaghị m iweli aka m imegide ha, meekwa ka ndị ohu ha kwakọrọ ihe niile ha nwere. Mgbe ahụ, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m.
ZEC 2:10 “Tie mkpu ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị Ada Zayọn. Nʼihi na ana m abịa ibi nʼetiti gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
ZEC 2:11 “Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ mba dị iche iche ga-adịnyere Onyenwe anyị, bụrụkwa ndị nke m. Aga m ebi nʼetiti gị, ị ga-amatakwa na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ka m bịakwute gị.
ZEC 2:12 Onyenwe anyị ga-eketa Juda dịka oke ya nʼime ala ahụ dị nsọ. Ọ ga-ahọrọkwa Jerusalem ọzọ.
ZEC 2:13 Derenụ duu nʼihu Onyenwe anyị, unu mmadụ niile, nʼihi na o sitela nʼebe obibi ya dị nsọ kpalie onwe ya.”
ZEC 3:1 Mgbe ahụ, o gosiri m Joshua onyeisi nchụaja ka ọ na-eguzo nʼihu mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, na ekwensu ka ọ na-eguzo nʼaka nri ya ibo ya ebubo.
ZEC 3:2 Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Onyenwe anyị basiere gị mba ike, gị ekwensu. Onyenwe anyị, onye họpụtara Jerusalem, basiere gị mba ike. Nwoke a, ọ bụghị ọlọkọ ọkụ na-ere ere, nke e si nʼime ọkụ gụpụta?”
ZEC 3:3 Mgbe Joshua guzo nʼihu mmụọ ozi ahụ, uwe ya ruru unyi.
ZEC 3:4 Mmụọ ozi ahụ gwara ndị ahụ guzo ya nʼihu, “Yipụnụ ya uwe a ruru unyi.” Mgbe ahụ, ọ gwara ya okwu sị, “Lee, ewepụla m mmehie gị, ma ugbu a, aga m eyikwasị gị uwe mmemme ndị a.”
ZEC 3:5 Ekwuru m, “Ka ha were ezi akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi.” Ya mere ha weere akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi, yikwasịkwa ya uwe ọhụrụ. Mmụọ ozi Onyenwe anyị guzokwa nʼebe ahụ.
ZEC 3:6 Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nyere Joshua ndụmọdụ sị,
ZEC 3:7 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ bụrụ na i jee ije nʼụzọ m niile, ọ bụrụkwa na i debe ihe niile m nyere gị nʼiwu, ị ga-abụ onyeisi ezinaụlọ m, ị ga-elekọta ụlọnsọ m anya, aga m enyekwa gị ọnọdụ nʼetiti ndị a niile guzo nʼebe a.
ZEC 3:8 “ ‘Gee m ntị, gị Joshua, onyeisi nchụaja na unu ndị nchụaja ndị ọzọ nọ nʼihu gị, ndị bụ ihe ngosi banyere ihe ọma niile nke gaje ịbịa. Agaje m ịkpọta nwaodibo m, onye bụ Ngalaba ahụ.
ZEC 3:9 Lee, nkume nke m guzobere nʼihu Joshua. Nkume ahụ nwere akụkụ asaa nʼahụ ya, aga m egbunye akara dee ihe nʼelu ya. Aga m ewezugakwa mmehie nke ala a nʼotu ụbọchị.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
ZEC 3:10 “ ‘Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-akpọbata mmadụ ibe ya, ka ọ bịa soro ya nọdụ nʼokpuru osisi vaịnị ya, na nʼokpuru osisi fiig ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”
ZEC 4:1 Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu lọghachiri kpọtee m, dịka e si akpọte onye nọ nʼụra.
ZEC 4:2 Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ana m ahụ ihe ịdọba oriọna e ji ọlaedo mee. O nwere ọkwa nʼisi ya, nweekwa oriọna asaa, nke na-enwu nʼelu ya. Oriọna asaa ndị a nwekwara okporo asaa e si agbanye mmanụ nʼime ha.
ZEC 4:3 Ahụkwara m osisi oliv abụọ nke dị nʼakụkụ ihe ịdọba oriọna ahụ. Otu dị nʼotu akụkụ ya, nke ọzọ, nʼakụkụ nke ọzọ.”
ZEC 4:4 A sịrị m mmụọ ozi ahụ na-ekwuru m okwu, “Nna m ukwu, gịnị ka nke a pụtara?”
ZEC 4:5 Mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu sịrị m, “Ị na-ekwu na ị maghị ihe ha bụ?” Azara m sị, “Ee, nna m ukwu, amaghị m.”
ZEC 4:6 Ọ sịrị m, “Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị nye Zerubabel. ‘Ọ bụghị site nʼike, maọbụ site nʼume, kama ọ bụ site na Mmụọ m,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
ZEC 4:7 “Gịnị ka ị bụ, gị ugwu dị ukwuu? Ị ga-aghọ ala dị larịị nʼihu Zerubabel. Mgbe ahụ, ọ ga-awapụta isi nkume ahụ site nʼiti oke mkpu ọṅụ, ‘Amara! Amara dịrị ya!’ ”
ZEC 4:8 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị sị,
ZEC 4:9 “Zerubabel wara ntọala ụlọnsọ ukwu a, ọ bụ ya ga-ewuchakwa ya. Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu.
ZEC 4:10 “Onye na-eleda ụbọchị ihe nta anya ebe ọ bụ nʼanya asaa nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ejegharị na-elezu ụwa dum, ga-aṅụ ọṅụ mgbe ha hụrụ nkume eji atụ mgbidi nʼaka Zerubabel?”
ZEC 4:11 Mgbe ahụ, a sịrị m ya, “Gịnị bụ osisi oliv abụọ ahụ dị nʼaka nri na nʼaka ekpe ihe ịdọba oriọna ahụ?”
ZEC 4:12 A sịkwara m ya nke ugboro abụọ, “Gịnị bụ alaka osisi oliv abụọ ndị a dị nʼakụkụ okporo ọlaedo abụọ ahụ, nke e si na ha na-awụpụta mmanụ ọlaedo?”
ZEC 4:13 Ọ sịrị m, “Ọ pụtara na ị maghị ihe ha bụ?” Asịrị m, “Mba, nna m ukwu.”
ZEC 4:14 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ndị a bụ mmadụ abụọ a họpụtara tee mmanụ, ife ya ofufe bụ Onyenwe ụwa niile.”
ZEC 5:1 Ọzọkwa, eleliri m anya elu, ma hụ akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ nke na-efegharị efegharị.
ZEC 5:2 Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?” Azara m, “Ahụrụ m akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ nke na-efegharị efegharị. Ogologo ya dị mita iri, obosara ya dịkwa mita ise.”
ZEC 5:3 Ọ gwara m, “Nke a bụ ọbụbụ ọnụ nke na-apụ na-ejezu nʼala ahụ niile. Nʼihi na dịka e si detuo ya, nʼotu akụkụ ya, a ga-esi nʼala a chụpụ ndị na-ezu ohi. Dịka e si deekwa ya nʼakụkụ nke ọzọ ya, onye ọ bụla na-aṅụ iyi ụgha ka a ga-esitekwa nʼala ahụ chụpụ.
ZEC 5:4 Ezipụla m ya, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, ‘Ọ ga-abanye nʼụlọ onye ọ bụla na-ezu ohi, na nʼụlọ ndị ji aha m na-aṅụ iyi ụgha. Ọ ga-anọgide nʼụlọ ahụ mebie ya kpamkpam. Ọ ga-emebi osisi na nkume niile e ji wuo ụlọ ahụ.’ ”
ZEC 5:5 Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu bịakwutere m sị, “Lelie anya gị elu hụrụ ihe na-aga ịpụta ìhè.”
ZEC 5:6 Asịrị m, “Gịnị ka ọ bụ?” Ọ sịrị, “Ọ bụ nkata.” O kwukwara, “Nke a bụ mmehie nke ndị niile bi nʼala a.”
ZEC 5:7 Ngwangwa, e kpughepụrụ okwuchi nkata ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwanyị nọdụrụ ọdụ nʼime ya.
ZEC 5:8 Ọ sịrị, “Nke a bụ ajọ omume.” O nughachiri ya azụ nʼime nkata ahụ werekwa okwuchi nkata ahụ kpuchie ya.
ZEC 5:9 Mgbe ahụ, eleliri m anya hụ ụmụ nwanyị abụọ ọzọ, ndị ikuku na-efe nku ha. Ha nwere nku dịka nku ụgbala. Ha buliri nkata ahụ elu nʼetiti eluigwe na ala.
ZEC 5:10 Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Ebee ka ha bu nkata ahụ na-aga?”
ZEC 5:11 Ọ gwara m, “Ha bu ya na-aga Babilọn ebe ha ga-ewuru ya ụlọ. Mgbe ha wuchara ụlọ ahụ, ha ga-adọba nkata ahụ nʼelu ihe ndọkwasị.”
ZEC 6:1 Elelikwara m anya elu ọzọ hụ ụgbọ ịnyịnya anọ nke si nʼetiti ugwu abụọ na-apụta. Ugwu ndị a bụ ugwu e ji bronz mee.
ZEC 6:2 Ụgbọ ịnyịnya nke mbụ ka ịnyịnya na-acha ọbara ọbara na-adọkpụ. Nke abụọ ka ịnyịnya na-eji nji na-adọkpụ.
ZEC 6:3 Nke atọ ka ịnyịnya dị ọcha na-adọkpụ, ma nke anọ ka ịnyịnya tụrụ agwa siekwa ike na-adọkpụ.
ZEC 6:4 Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Gịnị ka ihe ndị a bụ, nna m ukwu?”
ZEC 6:5 Mmụọ ozi ahụ zara m, sị, “Ndị a bụ mmụọ anọ nke eluigwe, ka ha na-apụ mgbe ha guzochara nʼihu Onyenwe elu ụwa niile.
ZEC 6:6 Ụgbọala nke ịnyịnya ndị dị oji na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ugwu. Nke ịnyịnya ndị dị ọcha na-adọkpụ na-aga nʼọdịda anyanwụ. Nke ahụ ndị ịnyịnya na-adịghị ezi ọcha na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ndịda.”
ZEC 6:7 Mgbe ịnyịnya ndị ahụ dị ike pụtara, chọọ ka e nye ha ike ijegharị nʼụwa niile, ọ gwara ha sị, “Gaanụ jegharịa nʼụwa niile.” Nʼihi ya, ha pụrụ jegharịa nʼụwa niile.
ZEC 6:8 Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Ndị ahụ jere nʼakụkụ ugwu emeela ka Mmụọ m dajụọ nʼala dị nʼakụkụ ugwu.”
ZEC 6:9 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
ZEC 6:10 “Gaa nata Heldai, Tobaija na Jedaya, ndị a dọtara nʼagha si Babilọn lọta ọlaọcha na ọlaedo. Nʼotu ụbọchị ahụ, gakwaa nʼụlọ Josaya nwa Zefanaya.
ZEC 6:11 Jiri ọlaọcha na ọlaedo ahụ kpụọ otu okpueze, were ya kpukwasị Joshua nwa Jehozadak bụ onyeisi nchụaja nʼisi.
ZEC 6:12 Gwa ya na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nke a bụ nwoke ahụ aha ya bụ Ngalaba. Ọ ga-esi nʼebe nke ya wapụta wuo ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
ZEC 6:13 Ọ bụ ya ga-arụ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. A ga-eyikwasịkwa ya ịma mma dịka uwe, ọ ga-anọdụ nʼocheeze ya na-achị. Ọ ga-abụ onye nchụaja ga-anọ nʼocheeze ya, mee ka ịdị nʼotu dịrị nʼetiti ha abụọ.’
ZEC 6:14 Okpueze ahụ ka a ga-enye Heldaya, Tobaija, Jedaya na Hen, nwa Zefanaya, ka ọ bụrụ ihe ncheta nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
ZEC 6:15 Ndị nọ nʼebe dị anya ga-esi ebe ahụ bịa nye aka nʼọrụ iwu ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Unu ga-amatakwa na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu. Ihe ndị a niile ga-eme ma ọ bụrụ na unu akpachapụ anya rubere Onyenwe anyị Chineke unu isi.”
ZEC 7:1 Nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu nke Onyenwe anyị ruru Zekaraya ntị nʼụbọchị nke anọ, nʼọnwa nke itoolu, nke bụ ọnwa Kislev.
ZEC 7:2 Nʼoge a, ndị bi nʼobodo Betel ezitela Shareza, na Regem Melek, ha na ndị ọzọ ka ha bịa rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ,
ZEC 7:3 ka ọ jụkwaa ndị nchụaja nọ nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndị amụma, sị, “Ọ bụ m ruo ụjụ, bukwaa ọnụ nʼọnwa nke ise, dịka m si eme kemgbe ọtụtụ afọ ndị a gara aga?”
ZEC 7:4 Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị,
ZEC 7:5 “Gwanụ ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a, ‘Mgbe unu na-ebu ọnụ nʼọnwa nke ise ọbụla, na nʼọnwa nke asaa ọbụla, iri afọ asaa ndị a niile gara aga, ọ bụ mụ ka unu na-eburu ọnụ?
ZEC 7:6 Mgbe unu na-eri na-aṅụkwa, ọ bụ na unu anaghị eme ya maka nʼihi onwe unu?
ZEC 7:7 Ihe ndị a ha ọ bụghị okwu niile Onyenwe anyị kpọsara site nʼọnụ ndị amụma mbụ, mgbe Jerusalem na obodo niile dị ya gburugburu nọ nʼudo nwekwa ọganihu, nʼoge ndị mmadụ bi na Negev, ya na ala ndịda ugwu niile?’ ”
ZEC 7:8 Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru Zekaraya ntị na-asị,
ZEC 7:9 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi, meerenụ ibe unu ebere, ma gosikwa ibe unu ọmịiko.
ZEC 7:10 Unu emegbula ụmụ nwanyị di ha nwụrụ maọbụ nwa na-enweghị nne na nna maọbụ ndị ọbịa maọbụ ndị ogbenye. Unu echela echiche ọjọọ nʼobi unu megide ibe unu.’
ZEC 7:11 “Ma ha jụrụ ige ntị; ha sitere nʼobiike ha gbakụta m azụ ha, were mkpịsịaka rụchie ntị ha, ka ha ghara ige m ntị.
ZEC 7:12 Ha mere ka obi ha sie ike dịka nkume, jụ ige ntị nʼiwu, na nʼokwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sitere na Mmụọ ya zie ndị amụma mbụ ahụ. Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile were oke iwe.
ZEC 7:13 “ ‘Ebe ọ bụ na mgbe m kpọrọ ha, ha egeghị ntị, agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọ m,’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
ZEC 7:14 ‘Eji m oke ifufe gbasasịa ha nʼetiti mba niile, ndị ha na-amaghị. Emere m ka ala ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụ inwe ike ịpụ maọbụ ịbata nʼime ya. Otu a ka ha si mee ka ala ọma ahụ ghọọ ala tọgbọrọ nʼefu.’ ”
ZEC 8:1 Okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị,
ZEC 8:2 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “Ana m ekwo ekworo dị ukwuu nʼihi Zayọn. Nʼezie, ekworo ahụ na-anụ m ọkụ dị ukwuu nʼahụ.”
ZEC 8:3 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Aga m alọghachi na Zayọn, bịa biri na Jerusalem. Mgbe ahụ, a ga-akpọ Jerusalem, obodo Eziokwu. A ga-akpọkwa ugwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile Ugwu Nsọ.”
ZEC 8:4 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Agadi ndị ikom na agadi ndị inyom ga-anọdụkwa ala ọzọ na mbara ụzọ niile nke Jerusalem, onye ọbụla ga-ejidekwa mkpara nʼaka ya nʼihi ọnụọgụgụ afọ ha gbara.
ZEC 8:5 Okporoụzọ nke obodo ahụ niile ga-ejupụtakwa nʼụmụntakịrị ndị nwoke na ndị nwanyị na-egwugharị egwu na ama ebe ahụ.”
ZEC 8:6 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “O nwere ike bụrụ na ihe ndị a ga-adị ka ihe dịkarịrị ike imezu nʼanya ndị ahụ ga-afọdụ nʼoge ahụ, ma ọ ga-abụ ihe dịkarịrị ike ime nʼanya m?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
ZEC 8:7 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m azọpụta ndị m site na mba niile dị nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ.
ZEC 8:8 Aga m akpọghachitekwa ha, mee ka ha biri na Jerusalem. Ha ga-abụkwa ndị m, mụ onwe m ga-abụ Chineke ha, onye ezi omume na onye kwesiri ntụkwasị obi.”
ZEC 8:9 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “Ka aka unu sie ike, ka enwe ike wuo ụlọnsọ a, unu ndị na-anụ ugbu a otu okwu ahụ, nke ndị amụma kwuru mgbe a tọrọ ntọala iwugharị ụlọnsọ m, bụ ụlọ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
ZEC 8:10 Tupu ụbọchị ahụ, akwụbeghị ma ndị mmadụ ma ụmụ anụmanụ ụgwọ ọrụ ha. Ọ dịghịkwa udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼihi ndị iro ya, ebe m mere ka onye ọbụla bụrụ onye na-emegide ibe ya.
ZEC 8:11 Ma ugbu a, agaghị m emeso ndị fọdụrụ nʼala a, dịka m si meso ha nʼoge gara aga.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
ZEC 8:12 “Nʼihi na mkpụrụ ga-eto nke ọma, osisi vaịnị ga-amị mkpụrụ ya, ala ubi ga-ewepụtakwa ihe omume, igirigi eluigwe ga-ezokwasịkwa ala. Ihe ndị a niile ka m ga-enye ndị fọdụrụ nʼala a ka ọ bụụrụ ha ihe nketa.
ZEC 8:13 Dịka unu bụ Juda na Izrel si bụrụ ihe a na-abụ ọnụ nʼetiti mba dị iche iche, otu a ka m ga-esi zọpụta unu, unu ga-abụkwa ngọzị. Unu atụla ụjọ, kama meenụ ka aka unu sie ike nʼọrụ unu.”
ZEC 8:14 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Dịka m si kpebie ime ka ihe ọjọọ bịakwasị unu, na dịka m na-egosighị ebere nʼahụ nna nna unu ha mgbe ha kpasuru m iwe,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu,
ZEC 8:15 “otu a ka m kpebikwara ọzọ nʼụbọchị ndị a imere Jerusalem na Juda ihe ọma. Unu atụla ụjọ.
ZEC 8:16 Ihe ndị a ka unu ga-eme: Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, kpeenụ ikpe eziokwu nʼụlọikpe unu, nke a na-eweta udo.
ZEC 8:17 Unu echela echiche ọjọọ megide ibe unu; unu ahụla ịṅụ iyi ụgha nʼanya. Ihe ndị a niile ka m kpọrọ asị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
ZEC 8:18 Okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị,
ZEC 8:19 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu: “Ibu ọnụ unu na-ebu nʼọnwa nke anọ, ọnwa nke ise, ọnwa nke asaa na nʼọnwa nke iri ga-aghọrọ unu oge ịṅụrị ọṅụ na oge obi ụtọ. Ha ga-abụrụ Juda mmemme obi ụtọ. Nʼihi ya, hụnụ eziokwu na udo nʼanya.”
ZEC 8:20 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwukwa: “Ndị dị iche iche na ndị bi nʼọtụtụ obodo dị iche iche ka ga-abịa.
ZEC 8:21 Ndị bi nʼotu obodo ga-ejekwa nʼobodo ọzọ, sị, ‘Ka anyị jee na-atụfughị oge gaa rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ, ka anyị chọọnụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Mụ onwe m na-ejekwa.’
ZEC 8:22 Ọtụtụ ndị mmadụ na ọtụtụ mba dị ike ga-abịa Jerusalem ịchọ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ịrịọ ya arịrịọ.”
ZEC 8:23 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼụbọchị ndị ahụ, mmadụ iri, ndị ga-esi na mba dị iche iche, ndị na-asụkwa asụsụ dị iche iche, ga-ejide otu onye Juda aka nʼọnụ ọnụ uwe ya na-asị, ‘Kwere ka anyị soro gị jee, nʼihi na anyị anụla na Chineke nọnyeere unu.’ ”
ZEC 9:1 Okwu Amụma. Nke a bụ okwu Onyenwe anyị megide ala Hadrak, na obodo Damaskọs ka ọ ga-ezukwa ike, nʼihi nʼebe Onyenwe anyị nọ ka anya mmadụ niile na ebo niile nke Izrel dị.
ZEC 9:2 Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso; tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.
ZEC 9:3 Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike, tụkọba ọlaọcha dịka aja, na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ.
ZEC 9:4 Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri, ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya.
ZEC 9:5 Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme. Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu. Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla. A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya. Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn.
ZEC 9:6 Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd, aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị.
ZEC 9:7 Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha, wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya. Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị, ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda. Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus.
ZEC 9:8 Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche, ka ndị iro ghara ịbata na ya. Ndị mkpagbu agaghị emerikwa ndị m ọzọ nʼagha, nʼihi na anọ m na nche ugbu a.
ZEC 9:9 Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn! Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem! Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị, onye ezi omume na onye nwere mmeri, onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.
ZEC 9:10 Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem, na ịnyịnya agha niile nke Jerusalem; a ga-agbajikwa ụta agha. Ọ ga-ewetara mba niile udo, ọchịchị ya ga-esite nʼotu oke osimiri ruo nʼosimiri nke ọzọ, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo na nsọtụ niile nke ụwa.
ZEC 9:11 Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha, nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara.
ZEC 9:12 Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya. Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ.
ZEC 9:13 Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m, tinye Ifrem dịka àkụ. Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn, ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis. Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha.
ZEC 9:14 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha, àkụ ya ga-efekwa dịka amụma. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike, ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda.
ZEC 9:15 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha. Ha ga-ebibi, zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile. Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya; ha ga-ejupụta dịka efere, dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta.
ZEC 9:16 Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya, dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya. Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịa e tinyere nʼokpueze si na-egbuke.
ZEC 9:17 Nʼezie, lee ka ịdị mma nke ala ahụ si dị ukwuu! Leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu! Mkpụrụ ubi ga-eme ka ụmụ okorobịa tozuo oke nke ọma, mmanya vaịnị ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ doo ahụ.
ZEC 10:1 Rịọọnụ Onyenwe anyị mmiri ozuzo nʼoge mmiri ozuzo nke ikpeazụ, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-ezite oke amụma mmiri. Ọ bụ ya na-enye ụmụ mmadụ mmiri ozuzo, na-enyekwa mmadụ niile ihe ọkụkụ nke ubi.
ZEC 10:2 Arụsị niile na-ekwu okwu aghụghọ, ndị na-agba aja nʼahụ ọhụ bụ ụgha, ndị ha na-arọ nrọ, na-akọwakwa nrọ ụgha, okwu nkasiobi nke ihe na-adịghị nʼime ya ka ha na-enye. Ya mere, ndị mmadụ na-akpagharị dịka atụrụ a na-akpagbu ha nʼihi enweghị onye ọzụzụ atụrụ.
ZEC 10:3 “Iwe m na-ere ọkụ megide ndị ọzụzụ atụrụ, aga m atakwa ndị ndu niile ahụhụ; nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-elekọta igwe anụ ụlọ ya, ya bụ ndị Juda, ọ ga-eme ka ha dịrị ka ịnyịnya dị ebube nʼagha.
ZEC 10:4 A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ, a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu, a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha, sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche.
ZEC 10:5 Ha niile ga-ejikọta onwe ha ọnụ, dịka ndị bụ dike nʼagha, ha ga-azọda ndị iro ha nʼapịtị nke okporoụzọ niile. Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere ha, ha ga-alụgbukwa ndị iro niile na-agba ịnyịnya.
ZEC 10:6 “Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike, zọpụtakwa ụlọ Josef. Aga m eme ka ha lọghachita, nʼihi na aga m egosi ha obi ebere. Ha ga-adị ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha, aga m azakwa arịrịọ ha.
ZEC 10:7 Ndị Ifrem ga-aghọ ndị dị ike nʼagha, ha ga-enwe ọṅụ dịka ndị na-aṅụ mmanya. Ụmụ ha ga-ahụ ya ṅụrịakwa ọṅụ, ha ga-ejikwa obi ha niile ṅụrịa ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
ZEC 10:8 Mgbe ahụ, aga m akpọ ha oku, chịkọtaa ha. Nʼezie, aga m agbapụta ha, ha ga-adịkwa ukwuu dịka ha dị na mbụ.
ZEC 10:9 A sịkwarị na m chụsara ha nʼetiti ndị dị iche iche, ma ha ga-echeta m site nʼala niile ahụ dị anya. Ha na ụmụ ha ga-adịkwa ndụ; ha ga-alọtakwa.
ZEC 10:10 Aga m esi nʼala Ijipt kpọlata ha, sitekwa nʼAsịrịa chịkọtaa ha. Aga m akpọta ha na Gilead na Lebanọn. Ha agaghị enwekwa ebe ga-ezuru ha niile.
ZEC 10:11 Ha ga-esi nʼosimiri nsogbu gafee. A ga-emekwa ka mmali elu nke osimiri dajụọ. Ebe obibi niile nke osimiri Naịl ga-atakọrọkwa. A ga-egbuda mpako niile nke Asịrịa, wezugakwa mkpara ọchịchị nke ndị Ijipt.
ZEC 10:12 Aga m eme ka ha dị ike nʼime Onyenwe anyị, ọ bụkwa nʼaha ya ka ha ga na-ejegharị nʼudo.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
ZEC 11:1 Meghee ọnụ ụzọ gị niile, gị Lebanọn. Ka ọkụ repịa osisi sida gị niile.
ZEC 11:2 Kwasie akwa ike, gị osisi junipa, nʼihi na osisi sida adaala, nʼihi na e mebiela osisi ukwu ndị niile ahụ mabigara mma oke. Kwasienụ akwa ike, unu osisi ook nke Bashan, nʼihi na e gbudachala oke ọhịa ahụ!
ZEC 11:3 Gee ntị nʼụzụ akwa nke ndị ọzụzụ atụrụ, e mebiela ebe ịta nri mara mma nke anụ ụlọ ha. Gee ntị ka unu nụrụ olu mbigbọ nke ụmụ ọdụm, nʼihi na e bibiela oke ọhịa nke Jọdan.
ZEC 11:4 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke m kwuru, “Zụọnụ igwe ewu na atụrụ ndị a ga-egbu egbu nri.
ZEC 11:5 Ndị na-azụrụ ha na-egbu ha ma ọ dịghị ahụhụ na-abịakwasị ha. Ndị na-erekwa ha na-asị, ‘Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na abụ m ọgaranya.’ Ndị ọzụzụ ha adịghị enwe ọmịiko nʼahụ ha.
ZEC 11:6 Nʼihi na mụ onwe m agakwaghị egosi ndị ala a obi ebere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m ewere onye ọbụla nʼime ha nyefee nʼaka onye agbataobi ya, na nʼaka eze ha. Ha ga-ebibi ala a kpamkpam, ma mụ onwe m agaghị anapụta onye ọbụla site nʼaka ha.”
ZEC 11:7 Nʼihi ya, azụrụ m igwe ewu na atụrụ ndị ahụ a ga-egbu egbu, nke ka nke, ndị ahụ a na-emegbu emegbu. Eweere m mkpanaka abụọ, kpọọ otu nʼime ha Amara, kpọọ nke ọzọ Ịdị nʼotu. Azụkwara m igwe atụrụ ndị ahụ.
ZEC 11:8 Nʼime otu ọnwa, ewezugara m ndị ọzụzụ atụrụ atọ. Igwe ewu na atụrụ ndị ahụ kpọkwazịrị m asị, enwezighị m ike nweere ha ndidi.
ZEC 11:9 Nʼihi ya, ekwuru m si, “Agaghị m abụkwa onye ọzụzụ atụrụ unu ọzọ. Nke ọbụla na-anwụ, ya nwụọ, ọzọ, nke na-ala nʼiyi, ya laa nʼiyi. Ka ndị fọdụrụ rie anụ ahụ ibe ha.”
ZEC 11:10 Mgbe ahụ, eweere m mkpanaka m, nke a kpọrọ Amara gbajie ya abụọ, igosi na emebiela m ọgbụgba ndụ nke mụ na ndị mmadụ gbara.
ZEC 11:11 Nʼụbọchị ahụ ka e mere ka ọgbụgba ndụ ahụ gharakwa ịdị. Mgbe ahụ, ndị ahụ a na-akpagbu nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, bụ ndị na-ele m anya matara na ọ bụ okwu Onyenwe anyị.
ZEC 11:12 Mgbe ahụ, agwara m ha, “Ọ bụrụ na ọ masịrị unu, unu kwụọ m ụgwọ ọrụ m, ọ bụrụkwa na ọ masịghị unu, deberenụ onwe unu ego unu.” Nʼihi nke a, ha gụpụtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, jiri ya kwụọ m ụgwọ.
ZEC 11:13 Onyenwe anyị gwara m, “Tụpụrụ ya ọkpụ ite,” bụ ọnụahịa magburu onwe ya bụ nke ha rụrụ nʼisi m. Ya mere, eweere m iri ọlaọcha atọ ahụ tụpụrụ ya ọkpụ ite nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
ZEC 11:14 Mgbe ahụ, agbajiri m mkpanaka m nke abụọ a na-akpọ Ịdị nʼotu, izipụta na njikọta maọbụ ịdị nʼotu dị nʼetiti Juda na Izrel adịghịkwa.
ZEC 11:15 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m, “Chịrịkwa ngwa ọrụ nke onye ọzụzụ atụrụ nzuzu ahụ,
ZEC 11:16 nʼihi na ana m aga ịkpọlite otu onye ọzụzụ atụrụ nke na-agaghị elekọta ụmụ atụrụ furu efu, maọbụ chọọ ndị na-etolite, maọbụ gwọọ ndị merụrụ ahụ, maọbụ nye ndị ahụ dị ike nri. Kama ọ ga-eri anụ atụrụ ndị ahụ ahụ ha dị mma, nyakapụkwa ụkwụ ha niile.
ZEC 11:17 “Ahụhụ dịrị onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-abaghị uru, nke na-adịghị elezi igwe ewu na atụrụ ya anya. Ka mma agha gbupụ ya otu aka, ghụpụkwa ya anya aka nri ya. Ka ogwe aka ya kpọnwụọkwa kpamkpam. Otu a, anya aka nri ya ga-akpọkwa.”
ZEC 12:1 Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị banyere Izrel. Ọ bụ amụma. Onyenwe anyị, onye gbasapụrụ eluigwe niile, onye tọrọ ntọala ụwa, na onye kpụrụ mmụọ nke dị nʼime mmadụ, ekwupụtala, sị,
ZEC 12:2 “Agaje m ime Jerusalem ka ọ bụrụ iko mmanya nke ga-aṅagharị ndị niile gbara ya gburugburu. Ha ga-agba Juda na Jerusalem gburugburu, nọbichie ụzọ ya niile.
ZEC 12:3 Nʼụbọchị ahụ, mgbe mba niile nke ụwa chịkọtara onwe ha ọnụ imegide ya, aga m eme Jerusalem ka ọ ghọọrọ mba ndị ahụ niile nkume dị ukwuu nke a na-apụghị inugharị enugharị. Ndị niile ga-agbalị inugharị ya ga-emerụ onwe ha ahụ.
ZEC 12:4 Nʼụbọchị ahụ, aga m etinye ụjọ nʼobi ịnyịnya niile, mee ka ndị na-agba ha ghọọ ndị ara,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m asaghe anya m lekwasị ụlọ Juda nke ọma, ma aga m eme ka ịnyịnya niile nke mba niile kpuo ìsì.
ZEC 12:5 Mgbe ahụ, ndị ndu Juda ga-ekwu nʼobi ha sị, ‘Ndị Jerusalem achọtala ike nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke ha.’
ZEC 12:6 “Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka ndị ndu Juda niile dịrị ka ite ọkụ, nke a dọnyere nʼebe a chịkọtara nkụ. Ha ga-adịkwa ka ọkụ na-enwu enwu, nke dị nʼetiti ukwu ọka. Ha ga-ere ọkụ nʼaka nri na nʼaka ekpe, rechapụ ndị niile bi gburugburu ha. Ma mmadụ ga-ejupụtakwa nʼime Jerusalem.
ZEC 12:7 “Onyenwe anyị ga-ebu ụzọ zọpụta ebe obibi niile nke Juda, ime ka ugwu na nsọpụrụ nke ụlọ Devid, na nke ndị niile bi na Jerusalem ghara ịdị ukwuu karịa nke Juda.
ZEC 12:8 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-echebe ndị bi na Jerusalem, mee ka ọ bụladị ndị na-asọ ngọngọ nʼetiti ha dịrị ike dịka Devid. Ụlọ Devid ga-adịkwa ka Chineke, dịka Mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye na-eje nʼihu ha.
ZEC 12:9 Nʼụbọchị ahụ, aga m ebido ibibi mba ndị ahụ niile na-ebuso Jerusalem agha.
ZEC 12:10 “Mgbe ahụ, aga m awụkwasị nʼụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem, mmụọ nke amara na nke arịrịọ amara. Ha ga-elegidekwa m anya, bụ onye ahụ ha mapuru ahụ. Ha ga-eru ụjụ nʼihi ya, dịka mmadụ si eru ụjụ nʼihi ọnwụ nke nwa a mụrụ naanị ya. Ha ga-ebekwa akwa ilu nke ukwuu dịka mmadụ sị ebe akwa maka nwa mbụ ya.
ZEC 12:11 Nʼụbọchị ahụ, akwa a ga-akwa na Jerusalem ga-adị ukwuu, dịka akwa nke Hadad Rimọn nʼobosara ala Megido.
ZEC 12:12 Ndị ala ahụ niile ga-eru ụjụ. Ikwu ọbụla ga-eru ụjụ nke ha, ha na ndị nwunye ha. Ikwu Devid na ndị nwunye ha, na ikwu Netan na ndị nwunye ha,
ZEC 12:13 na ikwu Livayị, na ndị nwunye ha, na ikwu Shimei na ndị nwunye ha,
ZEC 12:14 na ikwu ndị ọzọ niile na ndị nwunye ha.
ZEC 13:1 “Nʼụbọchị ahụ, a ga-emeghe isi iyi mmiri nye ụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem. Ọ ga-abụ isi iyi a ga-eji sachapụ mmehie na adịghị ọcha ha niile.
ZEC 13:2 “Nʼụbọchị ahụ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri, aga m ebipụ aha arụsị niile dị nʼala ahụ, a gaghị echetakwa ha ọzọ. Aga m esitekwa nʼala a wezuga ma ndị amụma ma mmụọ nke adịghị ọcha niile.
ZEC 13:3 Ọ bụrụkwa na onye ọbụla a ga nʼihu na-ebu amụma, nne na nna ndị mụrụ ya ga-asị ya, ‘Ị ghaghị ịnwụ nʼihi na i kwuola okwu ụgha nʼaha Onyenwe anyị.’ Mgbe onye dị otu a bukwara amụma, ọ bụ nne na nna ya ga-eji ùbe magbuo ya.
ZEC 13:4 “Nʼụbọchị ahụ, ihere ga-emekwa ndị amụma nʼihi ibu amụma banyere ọhụ nke ha hụrụ. Ha agaghị eyikwa uwe ajị anụ nke ndị amụma na-eyi nʼihi iduhie ndị mmadụ,
ZEC 13:5 Onye ọbụla nʼime ha ga-asịkwa, ‘Abụghị m onye amụma, onye ọrụ ubi ka m bụ, ọ bụ ihe si nʼala ka m ji azụ onwe m site na mgbe m bụ okorobịa.’
ZEC 13:6 Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ, ‘Gịnị bụ ọnya ndị a niile dị gị nʼahụ?’ Ha ga-azaghachi, ‘Ọnya ndị etipụtara m nʼụlọ ndị enyi m.’
ZEC 13:7 “Teta nʼụra, gị mma agha, imegide onye ọzụzụ atụrụ m, na imegide nwoke ibe m, nke nọ m nso,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. “Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ ga-agbasasịkwa. Aga m eweli aka m megide ndị dị nta.
ZEC 13:8 Nʼala ahụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Ụzọ mmadụ abụọ nʼime ụzọ atọ ka a ga-etida, ma otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-afọdụ nʼime ya.
ZEC 13:9 Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ. Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha, jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo. Ha ga-akpọku aha m, aga m azakwa ha. Aga m asịkwa, ‘Ndị a bụ ndị m,’ Ha onwe ha ga-asịkwa, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.’ ”
ZEC 14:1 Lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa, mgbe a ga-ekesa ihe nkwata gị niile nʼetiti mgbidi gị.
ZEC 14:2 Aga m achịkọta mba niile ka ha bịa Jerusalem ibuso ya agha. Ha ga-adọta obodo ahụ nʼagha, tụtụkọọ ihe dị nʼụlọ niile, dinaa ndị inyom nʼike. A ga-adọta ọkara ndị bi nʼobodo ahụ nʼagha, duru ha gaa mba ọzọ. Ma ọkara nke ọzọ ka ha ga-ahapụ.
ZEC 14:3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-apụ ibuso ndị mba ọzọ ahụ agha, dịka o si ebu agha nʼụbọchị agha.
ZEC 14:4 Nʼụbọchị ahụ, ụkwụ ya ga-eguzo nʼelu Ugwu Oliv, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem. Mgbe ahụ, Ugwu Oliv ga-ekewa abụọ, mee ka ndagwurugwu buru ibu dịrị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Nʼihi ya, ugwu ahụ ga-eke onwe ya abụọ. Otu akụkụ ga-adị nʼugwu, nke ọzọ ga-adị nʼụzọ ndịda.
ZEC 14:5 Unu ga-esi na ndagwurugwu nke ugwu m ahụ gbalaga, nʼihi na ndagwurugwu ahụ ga-eru Azel. Unu ga-agbapụ dịka unu si gbapụ nʼoge gara aga, mgbe ala ọma jijiji ahụ, nʼoge Uzaya bụ eze Juda. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke m ga-abịa, ya na ndị nsọ ya.
ZEC 14:6 Nʼụbọchị ahụ, ìhè anyanwụ agaghị adị, oyi agaghị adị, mkpụrụ mmiri agaghị adịkwa.
ZEC 14:7 Ọ ga-abụ ụbọchị pụrụ iche, ụbọchị ehihie na abalị na-agaghị adịkwa. Ọ bụ ụbọchị nke naanị Onyenwe anyị maara. Ma ìhè ga-adịkwa nʼoge anyasị.
ZEC 14:8 Nʼụbọchị ahụ, mmiri na-enye ndụ ga-esi na Jerusalem na-asọpụta. Ọ ga-ekewa abụọ, ọkara ya ga-asọbanye nʼosimiri Nnu dị nʼihu anyanwụ ebe ọkara nke ọzọ ga-asọbanye nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ. Ha ga na-asọ nʼọkọchị na nʼudu mmiri.
ZEC 14:9 Ma Onyenwe anyị ga-abụ eze nʼelu ụwa niile. Nʼụbọchị ahụ, naanị otu Onyenwe anyị ga-adị, naanị aha ya kwa ka a ga na-efe ofufe.
ZEC 14:10 Ala niile, site na Geba ruo Rimọn, nke dị na ndịda Jerusalem ga-adị ka ọzara. Ma ọ bụ naanị Jerusalem ga-adị nʼebe lara elu. Ọ ga-adịkwa nʼọnọdụ ya site nʼọnụ ụzọ ama nke Benjamin ruo nʼebe ọnụ ụzọ ama nke Mbụ, ruo nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼAkụkụ, sitekwa nʼỤlọ elu Hananel ruo nʼebe a na-azọchapụta mmanya eze.
ZEC 14:11 A ga-ebiju na ya na-enweghị nsogbu. A gaghị emebikwa ya ọzọ. Jerusalem ga-ebikwa nʼudo na-atụghị egwu.
ZEC 14:12 Nke a bụ ọrịa ọjọọ nke Onyenwe anyị ga-eji kụda mba niile buru agha megide Jerusalem. Anụ ahụ ha ga-ere ure mgbe ha ka guzo ọtọ. Anya ha ga-erekwa ure, ire ha ga-erekwa ure nʼọnụ ha.
ZEC 14:13 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-etinye ndị mmadụ oke ụjọ nʼobi. Oke ọgbaaghara ga-adị nʼetiti ha, ha ga-alụsokwa ibe ha ọgụ.
ZEC 14:14 Ọ bụladị Juda ga-ebu agha na Jerusalem. A ga-akwakọrọ akụ ndị mba ọzọ dị ha nso, bụ ọtụtụ ọlaedo na ọlaọcha, na uwe mara mma.
ZEC 14:15 Ọrịa ọjọọ dị otu a ga-adakwasị ịnyịnya niile, na ịnyịnya muul, na ịnyịnya kamel niile, na ịnyịnya ibu niile, na anụ niile dị nʼogige ndị agha ha.
ZEC 14:16 Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ na mba niile ndị ahụ busoro Jerusalem agha, ga-abịa kwa afọ kpọọ isiala nye eze, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ka ha soro mee mmemme ụlọ Ikwu.
ZEC 14:17 Ọ bụrụ na ndị ọbụla si na mba dị iche iche esoghị jee Jerusalem ife Eze ahụ, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ha agaghị enwetakwa mmiri ozuzo.
ZEC 14:18 Ọ bụrụ na ndị Ijipt ajụ ịga soro ndị ọzọ ife ofufe ahụ, ha agaghị enweta mmiri ozuzo. Onyenwe anyị ga-eme ka ọrịa ọjọọ ahụ bịakwasị ha, dịka ọ siri bịakwasị mba ndị ahụ niile jụrụ iso mee mmemme ụlọ Ikwu.
ZEC 14:19 Nke a ga-abụ ahụhụ dịrị ndị Ijipt, na ndị mba dị iche iche, ndị na-agaghị eso na mmemme ụlọ Ikwu ahụ.
ZEC 14:20 Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-ede nʼahụ ataṅụ nke ịnyịnya niile na-anya nʼolu ha bụ nke a: “Ihe dị Nsọ nye Onyenwe anyị.” Ite niile e ji esi nri dị nʼụlọ nke Onyenwe anyị ga-adị ka efere nsọ ndị ahụ dị nʼihu ebe ịchụ aja.
ZEC 14:21 Ite niile dị na Juda, na nʼime Jerusalem ga-adị nsọ nye Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ndị niile bịara ịchụ aja ga-ewere ụfọdụ nʼime ite ndị a sie nri ịchụ aja ha. Nʼụbọchị ahụ kwa, a gaghị ahụ kwa ndị na-atụ mgbereahịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
MAL 1:1 Okwu amụma: Nke a bụ okwu Onyenwe anyị gwara Izrel site nʼọnụ Malakaị onye amụma.
MAL 1:2 “Ahụla m unu nʼanya,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ma unu na-asị, ‘Olee ụzọ i si hụ anyị nʼanya?’ “Ịsọ, ọ bụghị nwanne Jekọb?” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma otu ọ dị, ahụrụ m Jekọb nʼanya,
MAL 1:3 ma Ịsọ ka m kpọrọ asị, mee ugwu ya niile ka ha ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, werekwa ihe nketa ya nye nkịta ọhịa niile nke ọzara.”
MAL 1:4 Ndị Edọm nwere ike sị, “Ọ bụ ezie na e tikpọọla anyị, ma anyị ga-ewugharị nkpọnkpọ ebe niile.” Ma otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Ha nwere ike wugharịa ya, ma aga m akwadakwa ha ọzọ. Nʼihi na a ga-akpọ ha Obodo ihe ọjọọ, ndị Onyenwe anyị na-eweso iwe ruo mgbe ebighị ebi.
MAL 1:5 Anya unu ga-ahụ nke a ma unu ga-ekwukwa, ‘Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụladị ruo nʼofe oke ala Izrel!’ ”
MAL 1:6 “Nwa na-asọpụrụ nna ya, ohu na asọpụrụkwa onyenwe ya. A sị na m bụ nna, ebee ka egwu m dị. A sị na m bụ onyenwe mmadụ, ebee ka nsọpụrụ m dị?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Ọ bụ unu ndị nchụaja na-eleda aha m anya. “Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si eleda aha gị anya?’
MAL 1:7 “Unu na-eji anụ rụrụ arụ na-achụrụ m aja nʼelu ebe ịchụ aja m. “Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si merụọ ya?’ “Ọ bụ mgbe unu na-asị na tebul Onyenwe anyị bụ ihe e kwesiri ileda anya.
MAL 1:8 Mgbe unu ji anụ ndị kpuru ìsì achụrụ m aja, ọ bụghị ihe na-ezighị ezi ka unu na-eme? Mgbe unu na-ejikwa ndị dara ngwụrọ, na anụ na-arịa ọrịa, ọ bụghị ihe ọjọọ ka unu na-eme? Werenụ anụ ndị a bugara onye na-achị obodo unu dịka onyinye. Ọ ga-atọ ya ụtọ ịnabata onyinye dị otu a? Ọ ga-anabata unu?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
MAL 1:9 “Ma ugbu a, rịọọnụ Chineke ka o gosi anyị amara ya. Ọ bụrụ na unu ji onyinye ndị dị otu a nʼaka unu, ọ ga-egosi unu afọ ọma ya?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
MAL 1:10 “Ọ gaara adị m nnọọ mma ma a sị na otu onye nʼime unu ga-emechi ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ, ka unu gharakwa ịkwanye ọkụ na-enweghị isi nʼelu ebe ịchụ aja m. Ihe banyere unu adịghị atọ m ụtọ. Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. Agaghị m anabatakwa onyinye ọbụla si unu nʼaka.
MAL 1:11 Nʼihi na site nʼọwụwa anyanwụ ruo ọdịda ya, aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile. A ga-ewebatara m ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na onyinye dị ọcha nʼaha m, nʼebe niile, nʼihi na aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
MAL 1:12 “Ma unu na-eme ka ọ ghara ịdị nsọ mgbe unu na-asị na, Tebul Onyenwe anyị bụ ihe e merụrụ emerụ, ebe ihe oriri ya bụkwa ihe nlelị.
MAL 1:13 Unu na-ekwukwa, ‘Nke a bụ ihe ike ọgwụgwụ,’ si otu a na-eduli imi unu elu nʼebe m nọ nʼọnọdụ oke nlelị.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Mgbe unu na-ewebata ihe a natara nʼike, na nke dara ngwụrọ, na nke na-arịa ọrịa, jiri ha chụọrọ m aja, o kwesiri ka m nabata ya?” Ka Onyenwe anyị na-ekwu.
MAL 1:14 “Onye a na-abụ ọnụ ka onye aghụghọ ahụ bụ nke nwere oke nʼigwe ewu na atụrụ ya, kwee nkwa inye ya, ma mesịa were anụ nwere ntụpọ chụọrọ Onyenwe anyị aja. Nʼihi na mụ onwe m bụ Eze ukwu ahụ,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “aha m bụkwa ihe a ga-atụ egwu nʼetiti mba dị iche iche.
MAL 2:1 “Ma ugbu a, unu ndị nchụaja, ịdọ aka na ntị a dịrị unu.
MAL 2:2 Ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị, ọ bụrụkwa na unu ekpebighị nʼobi unu inye aha m otuto,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Aga m ezite ọbụbụ ọnụ nʼahụ unu, aga m abụkwa ngọzị unu niile ọnụ. E, abụọlarị unu ọnụ, nʼihi na unu ekpebighị nʼobi unu ịsọpụrụ m.
MAL 2:3 “Nʼihi unu, aga m abara ụmụ ụmụ unu mba. Agaghị m anabata onyinye unu, aga m efesakwa nsị anụ nʼihu unu, bụ nsị nke ihe onyinye unu, aga m ewezugakwa unu site nʼihu m.
MAL 2:4 Otu a ka unu ga-esi mara na ọ bụ mụ zitere unu ịdọ aka na ntị a, ka ọgbụgba ndụ mụ na Livayị gbara dịgide,” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu.
MAL 2:5 “Ọgbụgba ndụ mụ na ya bụ nke ndụ na udo, ọ bụ m nyere ha ya, nke a bụ nʼihi nsọpụrụ. O nyere m nsọpụrụ nʼezie, tụkwaa aha m egwu.
MAL 2:6 Iwu nke eziokwu dị ya nʼọnụ, ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a chọpụtara nʼegbugbere ọnụ ya. O soro m jee ije nʼudo, na nʼịkwụba aka ọtọ. O mekwara ka ọtụtụ si nʼajọ omume ha chigharịa.
MAL 2:7 “Nʼihi na egbugbere ọnụ onye nchụaja kwesiri ijupụta nʼihe ọmụma; e kwesikwara isi nʼọnụ ya mụta ihe, nʼihi na ọ bụ onyeozi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
MAL 2:8 Ma unu esitela nʼụzọ ahụ wezuga onwe unu, sitekwa nʼozizi unu mee ka ọtụtụ mmadụ sụọ ngọngọ. Unu emerụọla ọgbụgba ndụ nke Livayị.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
MAL 2:9 “Nʼihi nke a, emeela m ka unu bụrụ ndị a na-elelị anya, na ndị e wedara nʼala nʼihu ndị mmadụ niile, nʼihi na unu agbasoghị ụzọ m, kama unu na-ele mmadụ anya nʼihu, nʼihe metụtara iwu.”
MAL 2:10 Ọ bụghị otu Nna ka anyị niile nwere? Ọ bụghị otu Chineke ahụ kere anyị? Gịnị mere anyị ji na-emerụ ọgbụgba ndụ nna anyị ha site na-enweghị ntụkwasị obi na mmekọrịta anyị na ibe anyị?
MAL 2:11 Juda ekwesighị ntụkwasị obi. E meela ihe arụ nʼIzrel na nʼime Jerusalem: Juda emerụọla ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị hụrụ nʼanya, lụọkwa ada chi ndị mba ọzọ.
MAL 2:12 Ka Onyenwe anyị kewapụ onye mere ihe dị otu a nʼụlọ ikwu Jekọb, ka ọ ghara inwe onye akaebe, ka ọ ghara inwe onye ga-aza ya mgbe ọ kpọrọ oku maọbụ butere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye.
MAL 2:13 Ihe ọzọ unu na-emekwa bụ ndị a: unu na-eme ka anya mmiri unu jupụta nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị. Unu na-akwa akwa, na-eti mkpu akwa nʼihi na ọ naghị elenye anya nʼonyinye unu, maọbụ jiri obi ụtọ nabata ha.
MAL 2:14 Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị.
MAL 2:15 Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ.
MAL 2:16 “Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ Onyenwe Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.
MAL 2:17 Unu esitela nʼoke okwu unu mee ka ike gwụ Onyenwe anyị. Ma unu na-ajụ, “Olee ụzọ anyị si mee ka ike gwụ ya?” Mgbe unu na-asị, “Ndị niile na-eme ihe ọjọọ dị mma nʼanya Onyenwe anyị. Ihe ha na-atọkwa ya ụtọ,” maọbụ na-asịkwa, “Ebee ka Chineke ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi nọ?”
MAL 3:1 “Lee, aga m ezipu onyeozi m, onye ga-edozi ụzọ nʼihu m. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ahụ unu na-ele anya ya ga-abịa na mberede nʼụlọnsọ ukwu ya. Onyeozi nke ọgbụgba ndụ ahụ, onye ihe ya na-agụsị unu agụụ ike, ga-abịa,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
MAL 3:2 “Ma onye ga-anagide ụbọchị ọbịbịa ya ma guzokwa mgbe ọ pụtara ihe? Nʼihi na ọ ga-adị ka ọkụ na-anụcha anụcha, dịkwa ka ncha e ji asụ akwa.
MAL 3:3 Ọ na-anọdụ ala dịka ndị na-anụcha ọlaọcha ime ka ọ dị ọcha. Ọ ga-anụcha ndị Livayị, ime ka ha dị ọcha, dịka ọlaedo na ọlaọcha a nụchara anụcha tutu ruo mgbe ha ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye nʼezi omume.
MAL 3:4 Mgbe ahụ, onyinye Juda na Jerusalem ga-abụ onyinye Onyenwe anyị ga-anabata, dịka o si anabata ha nʼụbọchị ndị ahụ gara aga, na mgbe ochie gara aga.
MAL 3:5 “Mgbe ahụ, aga m abịa unu nso ikpe unu ikpe. Aga m abịakwa ngwangwa ịgbagide ha ama bụ ndị mgbaasị, na ndị na-akwa iko, na ndị na-aṅụ iyi ụgha, na ndị na-emegbu ndị inyom di ha nwụrụ, na ndị na-emegbu ndị na-enweghị nna, na ndị na-anapụ ndị ọbịa ikpe ziri ezi, ndị ahụ niile na-adịghị atụ egwu m.” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
MAL 3:6 “Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị adịghị agbanwe agbanwe. Ya mere, unu bụ ụmụ Jekọb ji dịgide.
MAL 3:7 Site nʼoge nna nna unu ha, unu esitela nʼidebe iwu na ụkpụrụ m wezuga onwe unu. Unu adịghịkwa edebe ha. Ya mere, lọghachikwutenụ m, mụ onwe m ga-alọghachikwute unu.” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Ma unu na-asị, ‘Anyị ga-esi aṅaa lọghachi?’
MAL 3:8 “Mmadụ ọ na-ezu ihe bụ nke Chineke nʼohi? Ma unu apụnarịla m ihe bụ nke m. “Ma unu na-ajụ: ‘Anyị si aṅaa na-ezu gị ohi?’ “Ọ bụ site nʼotu ụzọ nʼime ụzọ iri unu, onyinye na aja niile.
MAL 3:9 Nʼihi ya, ọbụbụ ọnụ dịịrị unu, ka mba niile unu ha, nʼihi na ọ bụ mụ onwe m ka unu na-ezu ohi.
MAL 3:10 Webatanụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile unu nʼime ụlọakụ m, ka nri jupụta nʼime ụlọ m. Jirinụ nke a nwalee m,” ka unu hụ ma mụ onwe m agaghị emeghe ọnụ ụzọ eluigwe, site na ya wụdatara unu ngọzị dị ukwuu, nke ga-ejubiga oke na ọnọdụ agaghị adị ichebe ha. Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
MAL 3:11 “Aga m egbochi ihe nripịa ndị ahụ niile ka ha ghara iripịa mkpụrụ ubi unu. Osisi vaịnị unu agakwaghị atụpụsị mkpụrụ ya nʼala tutu ruo mgbe ha chara.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
MAL 3:12 “Mgbe ahụ, mba niile dị iche iche ga-akpọ unu ndị a gọziri agọzi, nʼihi na ala unu ga-abụ nke na-enye ndị nwe ya obi ụtọ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
MAL 3:13 Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Unu ekwuola ọtụtụ okwu dị ike megide m.” “Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị ka anyị kwuru megide gị?’
MAL 3:14 “Unu ekwuola sị, ‘Ọ bụ ihe nzuzu ife Chineke ofufe, na ịtụ ya egwu. Gịnị bụ uru anyị na-erite site nʼidebe iwu ya, na ijegharị dịka ndị na-eru ụjụ nʼihu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile?
MAL 3:15 Ma site ugbu a gaa nʼihu, ndị nganga ka anyị ga-akpọ ndị ihe na-agara nke ọma. Nʼezie, ndị na-eme ihe ọjọọ ka ihe na-agara nke ọma. Ndị ahụ jikwa ihe ọjọọ ha na-anwa Chineke na-agbanarị ntaramahụhụ ya.’ ”
MAL 3:16 Mgbe ahụ, ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị gwarịtara ibe ha okwu, Onyenwe anyị ṅara ntị, nụkwa ihe ha na-ekwu. Nʼihu ya, e nwere akwụkwọ ncheta dị ya, ebe e dere aha ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ma na-echekwa echiche banyere aha ya.
MAL 3:17 “Nʼụbọchị ahụ m ga-eme ihe,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “ha ga-abụ ihe oke ọnụahịa nke aka m. Aga m echebe ha, dịka nna na-enwe ọmịiko ma chebekwa nwa ya nwoke na-efe ya.
MAL 3:18 Unu ga-ahụ ihe dị iche nʼetiti ndị ezi omume na ndị ajọ omume, hụkwa ihe dị iche nʼetiti ndị na-efe Chineke na ndị na-adịghị efe ya.
MAL 4:1 “Nʼezie, ụbọchị ahụ na-abịa, ọ ga-erekwa ọkụ dịka ebe a funyere ọkụ buru ibu. Mgbe ndị nganga, ndị na-eme ihe ọjọọ, ga-abụ igbugbo ọka, ụbọchị ahụ na-abịa ga-erechapụ ha,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Ọ dịkwaghị mgbọrọgwụ maọbụ alaka ọbụla ga-afọdụrụ ha.
MAL 4:2 Ma unu bụ ndị na-atụ egwu aha m ka anyanwụ nke ezi omume ga-achawapụta wetakwara unu ọgwụgwọ nke si nʼime nku ya. Unu ga-apụkwa, na-awụgharị dịka ụmụ ehi eji nri zujuo afọ.
MAL 4:3 Mgbe ahụ, unu ga-azọpịakwa ndị ajọ omume. Ha ga-aghọkwa ntụ nʼokpuru ọbụ ụkwụ unu, nʼụbọchị ahụ m ga-eme ihe ndị a,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
MAL 4:4 “Chetanụ iwu Mosis, bụ odibo m, ya bụ iwu na ụkpụrụ ndị ahụ dị iche iche m nyere ya na Horeb, maka Izrel niile.
MAL 4:5 “Lee, aga m ezitere unu Ịlaịja onye amụma, tupu ụbọchị ukwu ahụ dị oke egwu bụ ụbọchị Onyenwe anyị abịa.
MAL 4:6 Ọ ga-eme ka obi ndị bụ nna chigharịkwute ụmụ ha, meekwa ka obi ndị bụ ụmụ chigharịkwutekwa nna ha; ka m ghara ịbịa ma jiri ịbụ ọnụ laa ala ahụ nʼiyi.”
MAT 1:1 Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham.
MAT 1:2 Ebraham mụrụ Aịzik, Aịzik amụọ Jekọb, Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya.
MAT 1:3 Juda mụtara Perez na Zera site na Tama, Perez mụrụ Hezrọn, Hezrọn amụọ Aram.
MAT 1:4 Aram mụrụ Aminadab, Aminadab mụrụ Nashọn, Nashọn amụọ Salmọn.
MAT 1:5 Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab, Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut, Obed amụọ Jesi.
MAT 1:6 Jesi amụọ Devid, bụ eze. Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya.
MAT 1:7 Solomọn mụrụ Rehoboam, Rehoboam amụọ Abija, Abija amụọ Esa.
MAT 1:8 Esa mụrụ Jehoshafat, Jehoshafat amụọ Joram, Joram amụọ Ụzaịa.
MAT 1:9 Ụzaịa mụrụ Jotam, Jọtam amụọ Ehaz, Ehaz amụọ Hezekaya.
MAT 1:10 Hezekaya mụrụ Manase, Manase amụọ Emọn, Emọn amụọ Josaya.
MAT 1:11 Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya.
MAT 1:12 Mgbe ha si Babilọn lọta Jekonaya mụrụ Shealtiel, Shealtiel amụọ Zerubabel.
MAT 1:13 Zerubabel mụrụ Abiud, Abiud amụọ Eliakịm, Eliakịm amụọ Azoa.
MAT 1:14 Azoa mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Akịm, Akịm amụọ Eliud.
MAT 1:15 Eliud mụrụ Elieza, Elieza amụọ Matan, Matan amụọ Jekọb.
MAT 1:16 Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst.
MAT 1:17 Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ.
MAT 1:18 Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ.
MAT 1:19 Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo.
MAT 1:20 Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ.
MAT 1:21 Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.”
MAT 1:22 Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị,
MAT 1:23 “Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”).
MAT 1:24 Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya.
MAT 1:25 Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.
MAT 2:1 Mgbe a mụchara Jisọs na Betlehem nke Judịa nʼoge Herọd bụ eze, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịaruru Jerusalem,
MAT 2:2 na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ọ nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya.”
MAT 2:3 Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem.
MAT 2:4 Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ.
MAT 2:5 Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị,
MAT 2:6 “ ‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda, ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda, nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta, onye ga-achị ndị nke m Izrel.’”
MAT 2:7 Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè.
MAT 2:8 O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, “Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya.”
MAT 2:9 Mgbe ha nụrụ okwu eze, ha pụrụ gawa, ma kpakpando ahụ ha hụrụ nʼọwụwa anyanwụ pụtakwara ọzọ, na-aga nʼihu ha ruo mgbe ọ bịara guzo nʼelu ebe nwantakịrị ahụ nọ.
MAT 2:10 Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ.
MAT 2:11 Ka ha banyere nʼụlọ ahụ, ha hụrụ nwantakịrị ahụ na nne ya Meri, ha gburu ikpere nʼala ma kpọọrọ ya isiala. Ha meghere akpa akụ ha nye ya onyinye ọlaedo na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na máá.
MAT 2:12 Nʼihi na a dọrọ ha aka na ntị na nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd, ha sitere nʼụzọ ọzọ laghachi obodo ha.
MAT 2:13 Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Onyenwe anyị mere ka Josef hụ ya na nrọ, ọ sịrị ya, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipt. Alọghachikwala tutu ruo mgbe m ga-agwa gị, nʼihi na Herọd na-achọ nwantakịrị a ka o gbuo ya.”
MAT 2:14 Nʼoge abalị, Josef biliri kpọrọ Meri na nwantakịrị ahụ gbalaa Ijipt.
MAT 2:15 Ebe ahụ ka ha nọgidere tutu ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a mere ka okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo. “Ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.”
MAT 2:16 Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị.
MAT 2:17 E sitekwara otu a mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị,
MAT 2:18 “A nụrụ otu olu na Rema, ịkwa akwa na oke iru ụjụ dị, Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya; ọ dịghị nkasiobi ọbụla dịrị ya, nʼihi na ha adịghịkwa.”
MAT 2:19 Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nʼIjipt
MAT 2:20 sị ya, “Bilie, kpọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya laghachi nʼala Izrel nʼihi na ndị na-achọ igbu ya anwụọla.”
MAT 2:21 Ya mere, o biliri, kpọọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya, laghachi nʼala Izrel.
MAT 2:22 Mgbe ọ nụrụ na eze ọhụrụ gbanwere Herọd na Judịa bụ nwa ya a na-akpọ Akelus, egwu tụrụ Josef ịlaghachi ebe ahụ. Ma nʼihi na adọwo ya aka na ntị na nrọ, ọ wezugara onwe ya gaa nʼakụkụ Galili.
MAT 2:23 Ọ gara biri nʼobodo a na-akpọ Nazaret. E sitekwara otu a mezuo okwu ọnụ ndị amụma sị na, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”
MAT 3:1 Nʼoge ahụ, Jọn omee baptizim bịara na-ezisa ozi nʼọzara Judịa. Isi okwu ya bụ,
MAT 3:2 “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.”
MAT 3:3 Nʼihi na nwoke a bụ onye e kwuru okwu banyere ya site nʼọnụ onye amụma Aịzaya sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ”
MAT 3:4 Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.
MAT 3:5 Nʼoge ahụ, ndị mmadụ sitere Jerusalem, na Judịa niile, nʼala niile dị Jọdan gburugburu, na-apụkwuru ya.
MAT 3:6 Mgbe ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan.
MAT 3:7 Ma mgbe ọhụrụ ọtụtụ ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha na-abịa ka e mee ha baptizim, ọ sịrị ha, “Unu ụmụ ajụala, onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa?
MAT 3:8 Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu.
MAT 3:9 Unu echekwala na unu pụrụ ị sị nʼime onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna,’ nʼihi na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ.
MAT 3:10 Ma ugbu a atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi niile. Osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu, tụba ya nʼime ọkụ.
MAT 3:11 “Mụ onwe m ji mmiri eme unu baptizim nʼihi nchegharị, ma onye dị ike karịa m na-abịa. Onye m na-erughị ịchịta akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ were mee unu baptizim.
MAT 3:12 Ihe ịfụcha ọka ya dị ya nʼaka, ọ ga-azacha ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, chịkọta mkpụrụ ọka wiiti tinye ha nʼọba, ma jiri ọkụ a na-apụghị imenyụ emenyụ rechapụ igbugbo ọka.”
MAT 3:13 Mgbe ahụ, Jisọs sitere na Galili bịa nʼosimiri Jọdan ka Jọn mee ya baptizim.
MAT 3:14 Ma Jọn chọrọ igbochi ya, sị, “Ọ bụ m kwesiri ịbịakwute gị ka ị mee m baptizim. Gịnị mere i ji abịakwute m?”
MAT 3:15 Ma Jisọs zara ya sị, “Kwere ka ọ dịrị otu a ugbu a, o kwesiri ka anyị mezuo ezi omume niile.” Mgbe ahụ Jọn kwenyere.
MAT 3:16 Ngwangwa e mechara Jisọs baptizim, o sitere na mmiri ahụ rịpụta. Nʼotu oge ahụ, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ nke Chineke ka o si nʼelu fedata dị ka nduru na-ebekwasị Jisọs nʼisi.
MAT 3:17 Otu olu sitere nʼeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Ihe ya dị m ezi mma.”
MAT 4:1 Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisọs baa nʼọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa.
MAT 4:2 Mgbe o busiri ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, agụụ gụrụ ya nke ukwuu.
MAT 4:3 Mgbe ahụ onye ọnwụnwa ahụ bịakwutere ya sị, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.”
MAT 4:4 Ma Jisọs zara, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụghị naanị site na achịchaka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ Chineke pụta.’”
MAT 4:5 Mgbe ahụ, ekwensu duuru ya baa nʼobodo nsọ ahụ, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu,
MAT 4:6 sị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’”
MAT 4:7 Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa.’”
MAT 4:8 Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.
MAT 4:9 Ọ sịrị ya, “Aga m enye gị ha niile ma ọ bụrụ na ị daa nʼala kpọọ isiala nye m.”
MAT 4:10 Ma Jisọs sịrị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ị ga-efekwa.’”
MAT 4:11 Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere ya, nọnyere ya, na-ejere ya ozi.
MAT 4:12 Mgbe Jisọs nụrụ na e tinyela Jọn nʼụlọ mkpọrọ, ọ pụrụ gaa Galili.
MAT 4:13 Emesịa, ọ hapụrụ Nazaret gaa biri na Kapanọm, bụ obodo dị nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ dị nso nʼoke ala Zebụlọn na Naftalị.
MAT 4:14 Nʼụzọ dị otu a, amụma ahụ Aịzaya buru mezuru. Amụma nke sịrị,
MAT 4:15 “Ala Zebụlọn na ala Naftalị, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ,
MAT 4:16 ndị nọ nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị bi nʼala onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.”
MAT 4:17 Site nʼoge ahụ gaa nʼihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.”
MAT 4:18 Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ.
MAT 4:19 Ọ sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”
MAT 4:20 Ha hapụrụ ụgbụ azụ ha otu mgbe ahụ soro ya.
MAT 4:21 Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha,
MAT 4:22 ngwangwa ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya.
MAT 4:23 Jisọs jegharịrị nʼobodo niile nke Galili, na-akụzi ihe nʼụlọ nzukọ niile ha, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche nʼetiti ndị ahụ.
MAT 4:24 Akụkọ banyere ya gbasara jezuo akụkụ Siria niile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha niile.
MAT 4:25 Ọtụtụ mmadụ sitere na Galili, Dekapọlịs, Jerusalem, Judịa na nʼofe osimiri Jọdan, soro ya.
MAT 5:1 Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya,
MAT 5:2 o bido ikuziri ha ihe. Ọ sịrị:
MAT 5:3 “Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.
MAT 5:4 Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ, nʼihi na a ga-akasị ha obi.
MAT 5:5 Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi, nʼihi na ha ga-eketa ụwa.
MAT 5:6 Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju.
MAT 5:7 Ngọzị na-adịrị ndị na-eme obi ebere, nʼihi na ha ka a ga-emere ebere.
MAT 5:8 Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi, nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya.
MAT 5:9 Ngọzị na-adịrị ndị na-eme ka udo dị nʼetiti mmadụ na ibe ya, nʼihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke.
MAT 5:10 Ngọzị na-adịrị ndị a na-emegbu nʼihi ezi omume, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.
MAT 5:11 “Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu, na-emegbu unu, ma na-ekwukwa okwu ọjọọ na ụgha niile dị iche iche megide unu nʼihi m.
MAT 5:12 Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.
MAT 5:13 “Unu bụ nnu nke ụwa, ma ọ bụrụ na nnu adịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ọ bakwaghị uru ọbụla, ma ọ bụghị naanị itufu ya, ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ.
MAT 5:14 “Unu bụ ihe nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nʼelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo.
MAT 5:15 Ndị mmadụ adịghị amụnye oriọna dọnye ya nʼokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba oriọna, ka o nye ndị niile nọ nʼụlọ ahụ ìhè.
MAT 5:16 Ya mere, kwerenụ ka ìhè unu nwuo nye mmadụ niile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu nke bi nʼeluigwe.
MAT 5:17 “Unu echela na m bịara ịkagbu iwu Mosis, maọbụ ozizi ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha.
MAT 5:18 Nʼezie, agwa m unu, na tutu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị otu mkpụrụ edemede ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, nke a ga-esi nʼIwu a wepụ ruo mgbe ha niile ga emezu.
MAT 5:19 Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe.
MAT 5:20 Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị ịba nʼalaeze eluigwe ma ọlị.
MAT 5:21 “Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’
MAT 5:22 Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘Raka,’ ya bụ Onye iberiibe,ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya,‘Onye nzuzu,’na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ.
MAT 5:23 “Ya mere, ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nʼebe ịchụ aja, ma cheta nʼebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nʼudo,
MAT 5:24 hapụ onyinye gị nʼebe ịchụ aja, laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu mere udo, laghachi bịa nye onyinye gị.
MAT 5:25 “Mee ọsịịsọ ka gị na onye kpọ gị eje ụlọ ikpe kpezie, mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nʼaka ọkaikpe, onye ga-enyefe gị nʼaka ndị nche, ma eleghị anya etinye gị nʼụlọ mkpọrọ.
MAT 5:26 Nʼezie, agwa m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri kobo niile i ji.
MAT 5:27 “Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Akwala iko.’
MAT 5:28 Ma asị m unu, onye ọbụla lere nwanyị anya site na-agụụ ịkwa iko emeelarị mmehie ịkwa iko nʼime obi ya megide nwanyị ahụ.
MAT 5:29 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị baa nʼalaeze karịa na i ji ahụ zuruoke baa nʼọkụ ala mmụọ.
MAT 5:30 Ọ bụrụ na aka nri gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị ma baa nʼalaeze eluigwe, karịa na i ji ahụ zuruoke ma baa nʼọkụ ala mmụọ.
MAT 5:31 “E kwukwara sị, ‘Onye ọbụla chọrọ ịgbara nwunye ya alụkwaghị m, ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya.’
MAT 5:32 Ma asị m unu, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ma ọ bụghị nʼihi ịkwa iko, ọ na-etinye nwanyị ahụ nʼọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.
MAT 5:33 “Ọzọkwa, unu nụrụ na a gwara ndị mmadụ nʼoge gara aga sị, ‘Aṅụla iyi ụgha, kama mezuo ihe niile unu ṅụrụ nʼiyi nye Onyenwe anyị.’
MAT 5:34 Ma asị m unu aṅụla iyi ọbụla. Ejikwala eluigwe aṅụ iyi nʼihi na eluigwe bụ ebe ocheeze Chineke dị.
MAT 5:35 Ejikwala ụwa aṅụ iyi nʼihi na ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya. Ejikwala Jerusalem aṅụ iyi nʼihi na ọ bụ obodo Eze ukwu ahụ.
MAT 5:36 Ejikwala isi gị aṅụ iyi nʼihi na ị pụghị ime ka otu agịrị isi gị dị ọcha maọbụ dị oji.
MAT 5:37 Aṅụla iyi ọbụla. Kama ka okwu unu bụrụ ‘E’ maọbụ ‘Ee’; ihe ọbụla gafere nke a sitere nʼaka ajọ onye ahụ.
MAT 5:38 “Unu anụla na e kwuru sị, ‘Ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze.’
MAT 5:39 Ma ana m asị unu eguzogidela onye bụ ajọ onye. Kama ọ bụrụ na mmadụ amaa gị ụra na ntị aka nri, tụgharịara ya ntị nke ọzọ.
MAT 5:40 Ọ bụrụ na mmadụ agbaa gị akwụkwọ nʼụlọikpe, ka ọ nara gị uwe ime gị, nyekwa ya uwe nke elu gị.
MAT 5:41 Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼike chọọ ka i soro ya gaa puku nzọ ụkwụ atọ, soro ya gaa puku nzọ ụkwụ isii.
MAT 5:42 Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka i binye ha ego.
MAT 5:43 “Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya, ma kpọkwanụ ndị iro unu asị.’
MAT 5:44 Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nʼanya, kpekwaaranụ ndị na-esogbu unu ekpere.
MAT 5:45 Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke Nna unu bi nʼeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọrọ ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.
MAT 5:46 Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu a.
MAT 5:47 Ọ bụrụkwa na unu na-ekele naanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọbụla dị iche nʼebe unu na ndị ọzọ nọ. Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ.
MAT 5:48 Ya mere, unu kwesiri izuoke nʼịrụ ọrụ ọma, dịka Nna unu bi nʼeluigwe si zukwaa oke.
MAT 6:1 “Kpacharanụ anya ka unu ghara ime ezi omume unu naanị ka ndị mmadụ hụ unu. Nʼihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọbụla site nʼaka Nna unu bi nʼeluigwe.
MAT 6:2 “Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị nọ na mkpa onyinye, nʼihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme nʼụlọ nzukọ na nʼokporoụzọ, ka ndị mmadụ too ha. Nʼezie, ana m agwa unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼizuoke.
MAT 6:3 Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, meenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime.
MAT 6:4 Ka onyinye gị bụrụ na nzuzo. Mgbe ahụ, Nna gị, onye na-ahụ ihe dị na nzuzo ga-akwụghachi gị.
MAT 6:5 “Mgbe ọbụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ihu abụọ, nʼihi na ha hụrụ iguzo nʼime ụlọ ekpere, nakwa nʼakụkụ ụzọ nʼanya na-ekpe ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha. Nʼezie, agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼebe o zuruoke.
MAT 6:6 Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nʼime ime ụlọ unu. Mechiekwanụ ụzọ unu, kpọkuonụ Nna unu nʼekpere na nzuzo. Mgbe ahụ Nna unu, onye na-ahụ ihe e mere na nzuzo, ga-enye unu ụgwọ ọrụ unu.
MAT 6:7 Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na a ga-anụ ekpere ha nʼihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu.
MAT 6:8 Unu adịla ka ha. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọbụla, Nna unu bi nʼeluigwe maara ihe na-akpa unu.
MAT 6:9 “Sinụ otu a na-ekpe ekpere: “ ‘Nna anyị nke bi nʼeluigwe, ka e doo aha gị nsọ.
MAT 6:10 Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nʼụwa, dịka e si eme ya nʼeluigwe.
MAT 6:11 Nye anyị nri nke ụbọchị taa.
MAT 6:12 Gbaghara anyị mmehie anyị, dịka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị.
MAT 6:13 Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa, kama, zọpụta anyị nʼaka ajọ onye ahụ.’
MAT 6:14 Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mgbe ha mehiere megide unu, Nna unu nke bi nʼeluigwe ga-agbagharakwa unu mmehie unu.
MAT 6:15 Ọ bụrụkwanụ na unu agbagharaghị ndị ọzọ mmehie niile ha, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu.
MAT 6:16 “Ọzọ, mgbe ọbụla unu na-ebu ọnụ, unu agbarụla ihu unu dịka ndị ihu abụọ na-eme. Nʼihi na ha na-agbarụ ihu ha ka ndị ọzọ hụ na ha na-ebu ọnụ. Nʼezie agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha.
MAT 6:17 Mgbe ị na-ebu ọnụ, tee isi gị mmanụ, ma saakwa ihu gị mmiri,
MAT 6:18 ka ndị ọzọ ghara ịhụta na ị na-ebu ọnụ kama ka ọ bụrụ naanị nye Nna gị, onye anya na-adịghị ahụ. Nna gị, onye na-ahụ ihe niile na-eme na nzuzo, ga-akwụ gị ụgwọ.
MAT 6:19 “Unu akpadola akụ nʼụwa nye onwe unu, ebe ọ ga-agba nchara, akịka atakwa ya, ebe ndị ohi ga-etiwa ma zukwaa ha.
MAT 6:20 Kama kwadoonụ akụ nʼeluigwe nye onwe unu, ebe ha na-agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị eri ha, ebe ndị ohi na-adịghị etiwa maọbụ zuo ihe.
MAT 6:21 Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.
MAT 6:22 “Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụkwa na anya gị adịrị ọcha, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè.
MAT 6:23 Ọ bụrụ na anya gị ajọọ njọ, akụkụ ahụ gị niile ga-ejupụta nʼọchịchịrị. Ọ bụrụkwa na ìhè ahụ dị nʼime gị aghọọ ọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ ga-adị ukwuu.
MAT 6:24 “Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.
MAT 6:25 “Nʼihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ ihe unu ga-aṅụ, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi nʼahụ. Ọ bụ ndụ akarịghị nri eji azụ ya, ka ọ bụ ahụ akarịghị ihe e ji ekpuchi ya?
MAT 6:26 Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịmaatụ. Ha adịghị akụ mkpụrụ nʼubi maọbụ ewe ihe ubi. Ha adịghị achịkọtakwa ihe debe nʼọba. Ma Nna unu nke bi nʼeluigwe na-azụ ha. Ọ bụ na unu adịghị oke ọnụahịa karịa ha?
MAT 6:27 Onye nʼetiti unu pụrụ itinye otu nkeji nʼogologo ụbọchị nke ndụya site nʼichegbu onwe ya?
MAT 6:28 “Gịnị mekwaranụ unu ji na-anọ nʼechiche oge niile maka uwe? Leenụ okoko osisi nke ọhịa. Ha adịghị arụ ọrụ maọbụ dọgbuo onwe ha nʼọrụ.
MAT 6:29 Ma asị m unu, ọ bụladị Solomọn nʼebube nke ịbụ eze ya niile, eyighị uwe ọbụla mara mma dị ka otu nʼime okoko osisi nke ọhịa ndị a.
MAT 6:30 Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ gaghị a chọọ unu mma karịa. Unu ndị okwukwe nta?
MAT 6:31 Nʼihi nke a, unu echegbukwala onwe unu na-asị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ maọbụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ maọbụ, ‘Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?’
MAT 6:32 Ọ bụ ihe ndị a ka ndị na-amaghị Chineke na-achọsi ike. Ma Nna unu bi nʼeluigwe maara na ọ dị unu mkpa.
MAT 6:33 Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.
MAT 6:34 Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere echi, nʼihi na echi ga-echere onwe ya. Nsogbu nke ụbọchị taa ezuorola ụbọchị taa.
MAT 7:1 “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe.
MAT 7:2 Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu.
MAT 7:3 “Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gịnʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya?
MAT 7:4 Olee otu ị ga-esi gwa ya si, ‘Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,’ mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ.
MAT 7:5 Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ tụpụ ntakịrị ahịhịa nke dị nwanna gị nʼanya.
MAT 7:6 “Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-azọtọ ha ma tụgharịakwa dọrie gị.
MAT 7:7 “Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ.
MAT 7:8 Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.
MAT 7:9 “Ọ dị onye nʼime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya arịọọ ya achịcha, ga-enye ya okwute?
MAT 7:10 Maọbụ, nwata ahụ arịọọ azụ, o nye ya agwọ?
MAT 7:11 Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe ọ gaghị enye unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya!
MAT 7:12 Ya mere, nʼime ihe niile, na-emeso ndị mmadụ dị ka i si chọọ ka ha mesoo gị. Nke a bụ nchịkọta ihe iwu na ndị amụma ziri.
MAT 7:13 “Sitenụ nʼọnụ ụzọ dị warawara banye. Nʼihi na ọnụ ụzọ ahụ dị obosara. Mbara ka ụzọ ahụ dịkwa na-eduba nʼịla nʼiyi. Ọtụtụ na-esoro ya.
MAT 7:14 Ole na ole na-achọta ụzọ ahụ na-eduba na ndụ, nʼihi na ọ dị warawara, dịkwa nkpagide.
MAT 7:15 “Kpachapụnụ anya! Nʼihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nʼụdịdị atụrụ, ma ha bụ agụ.
MAT 7:16 A ga-esite na mkpụrụha mata ndị ha bụ. Ndị mmadụ ọ na-esite nʼosisi ogwu dị nʼọhịa ghọta mkpụrụ osisi grepu, ka ha na-esite nʼosisi uke gbara nʼọhịa ghọta mkpụrụ fiig?
MAT 7:17 Nʼụzọ dị otu a, osisi ọbụla dị mma na-amịpụta mkpụrụ ọma, ma osisi dị njọ na-amịpụta mkpụrụ dị njọ.
MAT 7:18 Osisi na-amị mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịghịkwa amị mkpụrụ ọma.
MAT 7:19 Ma osisi ọbụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka a ga-egbutu tụnye ya nʼọkụ.
MAT 7:20 Ụzọ e si amata osisi ọma bụ site na mkpụrụ ya.
MAT 7:21 “Ọ bụghị ndị niile na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-abanye nʼalaeze eluigwe, kama ọ bụ naanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nʼeluigwe na-achọ ka ha mee.
MAT 7:22 Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ bụ na anyị ejighị aha gị buo amụma, jiri aha gị chụpụ mmụọ ọjọọ, ma jirikwa aha gị ruo ọtụtụ ọrụ ebube?’
MAT 7:23 Mgbe ahụ aga m agwa ha hoohaa sị ha, ‘Amaghị m unu, sitenụ nʼihu m pụọ, unu ndị ajọ omume!’
MAT 7:24 “Onye ọbụla ṅara ntị nʼokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nʼelu oke nkume.
MAT 7:25 Mmiri zosikwara ike nʼelu ụlọ ahụ, idee mmiri sọkwara, tie nʼụlọ ahụ. Ifufe siri ike fekwara, ma ụlọ ahụ adaghị. Nʼihi na e wuru ntọala ya nʼelu oke nkume.
MAT 7:26 Ma ndị niile nụrụ okwu ndị a, ma lefuru ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nʼelu aja.
MAT 7:27 Ngwangwa mmiri zoro, idee mmiri sọkwara, ifufe fesikwara ike tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala. Ọdịda ya dị ukwuu.”
MAT 7:28 Mgbe Jisọs kwuchara okwu ndị a, ozizi ya juru igwe mmadụ ahụ niile anya.
MAT 7:29 Nʼihi na o ziri ihe dịka onye nwere ikike. Ọ bụghị dị ka ndị ozizi iwu ha.
MAT 8:1 Ọtụtụ mmadụ sooro Jisọs mgbe o si nʼugwu ahụ rịdata.
MAT 8:2 Mgbe ha na-aga nʼụzọ, otu onye ekpenta bịakwutere ya kpọọ isiala nye ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
MAT 8:3 O setịpụrụ aka ya, metụ ya sị, “Achọrọ m ka ị dị ọcha, dịrịkwa ọcha!” Ngwangwa, ekpenta ahụ lara.
MAT 8:4 Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Hụ na ịgwaghị onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja onyinye dịka Mosis, nyere nʼiwu, ka ọ bụrụ ihe ama nye ya.”
MAT 8:5 Mgbe ọ banyere na Kapanọm, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ka o nyere ya aka.
MAT 8:6 Ọ sịrị, “Onyenwe m, onye na-ejere m ozi dina nʼụlọ nʼoke ihe mgbu, akụkụ ahụ ya kpọnwụkwara akpọnwụ.”
MAT 8:7 Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ m bịa gwọọ ya?”
MAT 8:8 Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, ekwesighị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m. Naanị nọdụ nʼebe a, kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa onye na-ejere m ozi ike.
MAT 8:9 Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a, ‘gaa.’ Ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ, ‘bịa.’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a.’ Ọ na-emekwa ya.”
MAT 8:10 Mgbe Jisọs nụrụ okwu a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ so ya okwu sị, “Nʼezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọbụla; ọ bụladị nʼIzrel niile.
MAT 8:11 Nʼezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ bịa soro Ebraham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nʼoriri nʼalaeze eluigwe.
MAT 8:12 Ma ụmụ alaeze ahụ, ka a ga-atụpụ nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.”
MAT 8:13 Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, “Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị.” Ahụ dịrị onye ahụ na-ejere ya ozi mma nʼotu awa ahụ.
MAT 8:14 Mgbe Jisọs ruru nʼụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwunye ya nwere ahụ ọkụ.
MAT 8:15 Ọ metụrụ ya aka, ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya, o biliri malite ijere ya ozi.
MAT 8:16 Nʼoge uhuruchi, ha kpọtaara ya ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. O ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ niile, gwọọkwa ndị niile ahụ na-adịghị ike.
MAT 8:17 Nke a bụ imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “O bupụrụ nrịa nrịa anyị niile, burukwa ọrịa anyị niile.”
MAT 8:18 Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ndị gbara ya gburugburu, ọ nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gafee nʼofe nke ọzọ.
MAT 8:19 Nʼoge ahụ, otu onye nʼetiti ndị na-ezi iwu bịakwutere ya sị ya, “Onye nkuzi, aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.”
MAT 8:20 Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina. Ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ; ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe obibi.”
MAT 8:21 Otu onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe m, aga m eso gị, kama kwere ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”
MAT 8:22 Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a. Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.”
MAT 8:23 Mgbe ọ banyere nʼụgbọ, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya.
MAT 8:24 Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma ọ nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme.
MAT 8:25 Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya, kpọtee ya, sị ya, “Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee, na anyị nʼala nʼiyi.”
MAT 8:26 Ma ọ zaghachiri, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii.
MAT 8:27 O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru.”
MAT 8:28 Mgbe o rutere nʼofe nke ọzọ nke obodo Gadarin, mmadụ abụọ ndị mmụọ ọjọọ si nʼebe a na-eli ozu zutere ya. Ha na-akpa ike nke ukwuu, na ọ dịkwaghị onye na-esite nʼụzọ ahụ agafe nʼihi ha.
MAT 8:29 Ngwangwa, ha tiri mkpu bido na-ajụ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Ọkpara Chineke? Ị gaghị echekwa eche ka oge ruo tupu ibido ịta anyị ahụhụ?”
MAT 8:30 Igwe ezi nọ nʼakụkụ ebe ahụ na-akpa nri.
MAT 8:31 Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya arịrịọ sị, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nʼime ezi ndị a.”
MAT 8:32 Ọ nyere ha iwu sị ha, “Ngwa, gaanụ!” Ha sitere nʼime mmadụ abụọ ahụ pụta banye nʼime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ kwa, ezi ndị ahụ niile gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ dabanyechaa nʼime mmiri ahụ. Ha nwụkwara nʼime ya.
MAT 8:33 Ndị na-elekọta igwe ezi ndị ahụ gbapụrụ gbaga nʼime obodo kọọrọ ha ihe niile mere; tinyere ihe mere ndị ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu.
MAT 8:34 Ya mere ndị niile nọ nʼobodo ahụ pụtara ịhụ Jisọs. Mgbe ha hụrụ ya ha rịọrọ ya sị ya pụọra ha nʼakụkụ obodo ha.
MAT 9:1 Jisọs banyekwara nʼụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo nʼobodo nke ya.
MAT 9:2 Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile.”
MAT 9:3 Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulu Chineke.”
MAT 9:4 Ma ebe Jisọs matara ihe ha na-eche nʼobi ha, ọ sịrị, “Gịnị mere unu ji na-eche ajọ echiche nʼobi unu?
MAT 9:5 Olee nke ka mfe ikwu? Ọ bụ ị sị, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ ị sị, ‘Bilie jee ije’?
MAT 9:6 Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Bilie, chịrị ute gị laa!”
MAT 9:7 Nwoke ahụ biliri, chịrị ute ya laa nʼụlọ ya.
MAT 9:8 Mgbe igwe mmadụ a hụrụ ihe ahụ mere, akpata oyi jụrụ ha nʼahụ nʼihi egwu. Ha tokwara Chineke onye na-enye ụmụ mmadụ ikike dị otu a.
MAT 9:9 Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-aga, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m.” Na-atụfughị oge, ọ hapụrụ ihe niile soro ya.
MAT 9:10 Dị ka ọ nọdụrụ ala iri nri uhuruchi nʼụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie sooro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri nri.
MAT 9:11 Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-eri nri?”
MAT 9:12 Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibịa na-akpa.
MAT 9:13 Ma gaanụ mụta ihe okwu a pụtara, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’Nʼihi na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie.”
MAT 9:14 Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ dị ka anyị onwe anyị na ndị Farisii na-eme?”
MAT 9:15 Jisọs jụrụ ha sị, “O kwesiri ka ndị enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọrọ na mwute na-erighị nri, mgbe ha na di nwanyị ọhụrụ nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ di nwanyị ọhụrụ nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.
MAT 9:16 “Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa, nʼihi na akwa ahụ ga-esi nʼebe a kwachiri ya dọwaa; mee ka ọ dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.
MAT 9:17 Ọ dịkwaghị onye ga-etinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ochie, nʼihi na karama ochie ahụ ga-agbawa mee ka mmanya ọhụrụ ahụ wufuo. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ, nke ga-echekwa ha abụọ nke ọma.”
MAT 9:18 Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi ụlọ ekpere bịara kpọọ isiala nye ya, sị, “Ọ dịbeghị anya nwa m nwanyị nwụrụ. Otu ọ dị, bịa ka ị bikwasị ya aka gị. Ọ ga-ebili dịkwa ndụ ọzọ.”
MAT 9:19 Nʼihi nke a, Jisọs soro ya gawa. Ndị na-eso ụzọ ya sokwara ha.
MAT 9:20 Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nʼọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa oruru ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nʼazụ bịaruo ya nso, metụ ọnụ uwe ya aka.
MAT 9:21 Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ ọnụ uwe ya aka, a ga-agwọ m.”
MAT 9:22 Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, nwee obi ike, nʼihi na e sitela nʼokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nʼoge ahụ.
MAT 9:23 Mgbe Jisọs batara nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ndị Juu ahụ, hụ igwe mmadụ ka ha na-atụ ụzụ na ndị na-egbu ọja.
MAT 9:24 Ọ sịrị ha, “Sinụ ebe a pụọ, nwata nwanyị a anwụghị anwụ, kama ọ nọ nʼụra.” Ma ha chịrị ya ọchị.
MAT 9:25 Ma mgbe achụpụsịrị igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼime ụlọ, jide nwata nwanyị ahụ nʼaka, o bilie ọtọ.
MAT 9:26 Akụkọ ọrụ ebube a gbasara nʼebe niile nʼala ahụ.
MAT 9:27 Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-apụ, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru ìsì sooro ya. Ha tikuru ya mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere anyị ebere!”
MAT 9:28 Ha sooro ya bata nʼụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Unu kwere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?” Ha zara sị ya, “E, Onyenwe anyị, anyị kweere.”
MAT 9:29 O metụrụ ha aka nʼanya sị ha, “Ya dịrị unu dị ka okwukwe unu si dị.”
MAT 9:30 Ngwangwa ndị ìsì ahụ bidoro ịhụ ụzọ. Jisọs maara ha ọkwa sị ha “Unu agwakwala onye ọbụla.”
MAT 9:31 Ma ha pụrụ gbasaa akụkọ a ebe niile nʼala ahụ.
MAT 9:32 Mgbe ndị a sitere nʼebe ahụ pụọ, ndị ọzọ buteere ya nwoke dara ogbi, onye mmụọ ọjọọ bikwa nʼime ya.
MAT 9:33 Mgbe ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a nʼala Izrel.”
MAT 9:34 Ma ndị Farisii sịrị, “Ọ bụ ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ, na-enye ya ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ.”
MAT 9:35 Jisọs jegharịrị nʼobodo niile na ogbe niile dị nʼebe ahụ, ma ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nʼụlọ ekpere ndị Juu, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche.
MAT 9:36 Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ niile na-abịakwute ya, ọmịiko ha mere ya, nʼihi na ha bụ ndị a na-esogbu. Ndị na-enweghị onye inyeaka. Ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.
MAT 9:37 Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Owuwe ihe ubi hiri nne nʼezie. Ma ndị ọrụ dị ole na ole.
MAT 9:38 Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya.”
MAT 10:1 Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha, na ịgwọ nrịa nrịa na ọrịa niile dị iche iche.
MAT 10:2 Nke a bụ aha ndị ozi iri na abụọ ahụ: Saimọn (onye a na-akpọkwa Pita) na Andru nwanne Saimọn; Jemis nwa Zebedi, na Jọn nwanne ya.
MAT 10:3 Filip na Batalomi; Tọmọs na Matiu onye ọna ụtụ; Jemis nwa Alfiọs, na Tadiọs.
MAT 10:4 Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye nʼaka ndị gburu ya.
MAT 10:5 Ndị ikom iri na abụọ ndị a ka Jisọs nyere ikike zipụ. Maara ha ọkwa sị ha: “Unu agala nʼebe ndị mba ọzọ, maọbụ nʼebe ndị Sameria nọ.
MAT 10:6 Kama jekwurunụ ụmụ Izrel, ndị bụ atụrụ furu efu.
MAT 10:7 Mgbe unu na-aga, na-ekwusaaranụ ha sị, ‘alaeze eluigwe a dịla nso.’
MAT 10:8 Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha,chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu.
MAT 10:9 “Mgbe unu na-aga, unu anatala ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ ọla ọbụla tinye nʼime belịt unu.
MAT 10:10 Unu ejikwala akpa maka njem unu, maọbụ uwe abụọ, maọbụ akpụkpọụkwụ, maọbụ mkpanaka. Nʼihi na onye ọrụ kwesiri ihe e ji azụ ya.
MAT 10:11 Ma obodo ọbụla maọbụ ogbe ọbụla unu bara nʼime ya, chọọnụ ụfọdụ ndị kwesiri nsọpụrụ bi nʼobodo ahụ. Nọgidekwanụ nʼụlọ ha ruo mgbe unu ga-ahapụ obodo ahụ.
MAT 10:12 Mgbe unu na-abanye nʼụlọ ahụ, keleenụ ndị bi na ya sị, udo dịrị unu.
MAT 10:13 Ọ bụrụ na ndị nọ nʼụlọ ahụ anabata unu, meenụ ka udo unu bịakwasị nʼụlọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha anabataghị unu, ka udo unu lọghachikwute unu.
MAT 10:14 Ọ bụrụ na onye ọbụla anabataghị unu, maọbụ jụ ịnụrụ okwu unu, mgbe unu na-ahapụ ụlọ ahụ maọbụ obodo ahụ kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu.
MAT 10:15 Nʼeziokwu, ọ ga-adịrị obodo ahụ njọ nʼụbọchị ikpe karịa obodo Sọdọm na Gọmọra.
MAT 10:16 “Ana m ezipu unu dị ka atụrụ nʼetiti agụ. Ya mere, nweenụ uche dịka agwọ. Burunu ndị a na-apụghị ịta ụta dịka nduru.
MAT 10:17 Kpachapụnụ anya. Nʼihi na a ga-enyefe unu nʼaka nzukọ ndị ụlọ ikpe, pịaakwa unu ihe nʼụlọ ekpere ha.
MAT 10:18 A ga-ekpe unu ikpe nʼihu ndị na-achị achị na nʼihu ndị eze nʼihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. E, nke a ga-enye unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị mba ọzọ.
MAT 10:19 Mgbe ha jidere unu na-ekpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, maọbụ otu unu ga-esi kwuo ya. Nʼihi na a ga-eme ka unu mata ihe unu ga-ekwu nʼoge ahụ.
MAT 10:20 Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nʼonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nʼeluigwe ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu.
MAT 10:21 “Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya, nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha.
MAT 10:22 Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
MAT 10:23 Mgbe ọbụla ndị mmadụ sogburu unu nʼotu obodo gbalaganụ nʼobodo ọzọ. Nʼezie, asị m unu, unu agaghị agazucha obodo niile nke Izrel tupu Nwa nke Mmadụ alọghachi.
MAT 10:24 “Nwata akwụkwọ adịghị akarị onye nkuzi ya. Ohu adịghị akarịkwa nna ya ukwu.
MAT 10:25 O zuorela onye na-eso ụzọ onye nkuzi ka ọ dị ka onye nkuzi ya, na ohu ahụ ka ọ dị ka onyenwe ya. Ọ bụrụ na a kpọrọ nna nwe ụlọ Belzebub, a ga-esi aṅaa ghara ịkpọ ndị ezinaụlọ ya ihe karịrị nke a?
MAT 10:26 “Ya mere unu atụla ha egwu. O nweghị ihe ọbụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, maọbụ ihe e zoro ezo nke a na-agaghị eme ka ọ pụta ìhè.
MAT 10:27 Ihe m na-agwa unu ugbu a na nzuzo, kọsaanụ ya mgbe chi bọrọ. Ihe m ji nwayọọ mee ka ọ baa unu na ntị, nọdụnụ nʼelu ụlọ kwusaa ya.
MAT 10:28 Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ.
MAT 10:29 Ọ bụghị otu kobo ka a na-ere ụmụ nza abụọ? Ma otu nʼime ha agaghị ada nʼala ma ọ bụrụ na Nna unu bi nʼeluigwe amaghị.
MAT 10:30 Ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ka a maara ọnụọgụgụ ha.
MAT 10:31 Ya mere, unu atụla egwu. Unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.
MAT 10:32 “Ya mere, onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, ka mụ onwe m ga-ekwupụta nʼihu Nna m bi nʼeluigwe.
MAT 10:33 Ma onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, mụ onwe m ga-agọnarịkwa ya nʼihu Nna m bi nʼeluigwe.
MAT 10:34 “Unu echekwala na m bịara iweta udo nʼụwa. Abịaghị m iweta udo, kama ọ bụ iwebata mma agha.
MAT 10:35 Abịara m ime, “ ‘Ka nwoke megide nna ya, ka nwa nwanyị megide nne ya, ka nwunye nwa megide nne di ya,
MAT 10:36 ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinaụlọ ya.’
MAT 10:37 “Ọ bụrụ na ị hụrụ nne gị maọbụ nna gị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. Ọ bụrụ na ị hụrụ nwa gị nwoke, maọbụ nwa gị nwanyị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m.
MAT 10:38 Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, ekwesighị ị bụ onye nke m.
MAT 10:39 Onye ọbụla chọtara ndụ ya ga-etufu ya, ma onye ọbụla tufuru ndụ ya maka m, ga-achọtakwa ya.
MAT 10:40 “Ndị niile nabatara unu na-anabata m. Mgbe ha nabatara m, ọ bụkwa Onye ahụ zitere m ka ha na-anabata.
MAT 10:41 Ọ bụrụ na unu anabata onye amụma nʼihi na ọ bụ onye amụma, unu na onye amụma ahụ ga-enwekọ otu ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụkwa na unu anabata onye ezi omume nʼihi ezi omume ya, unu ga-esorokwa ya nata ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume.
MAT 10:42 Ọ bụrụ na onye ọbụla ekunye otu nʼime ndị a na-eso ụzọ m mmiri oyi ka ọ ṅụọ, nʼihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, nʼezie, asị m unu, ọ ghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.”
MAT 11:1 Mgbe Jisọs nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ pụọ. Bido na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-ezisa oziọma.
MAT 11:2 Jọn omee baptizim nọkwa nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube niile nke Kraịst na-arụ, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya.
MAT 11:3 Ọ gwara ha ka ha jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ọbịbịa ya, ka ọ bụ onye ọzọ?”
MAT 11:4 Jisọs zara ha sị, “Laghachinụ azụ gwa Jọn banyere ihe unu nụrụ na ihe anya unu hụrụ.
MAT 11:5 Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha.Ndị ogbi na-anụ ihe, na-ekwu okwu. Ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ ya ihe banyere oziọma a na-ezisara ndị ogbenye.
MAT 11:6 Ziekwanụ ya ozi a, na ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.”
MAT 11:7 Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nʼọzara ịhụ Jọn, gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị?
MAT 11:8 Ma ọ bụghị otu a, gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? Ma lee ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa na-anọ nʼụlọ eze.
MAT 11:9 Ma gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, asị m unu, ọ bụ onye karịrị onye amụma.
MAT 11:10 Onye bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Lee, aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’
MAT 11:11 Nʼezie, ọ dịghị nwoke ọbụla nʼetiti ndị nwanyị mụrụ dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe dị ukwuu karịa ya.
MAT 11:12 Site nʼụbọchị ndị ahụ Jọn omee baptizim malitere ọrụ ya ruo ugbu a, ihe banyere alaeze eluigwe na-agabiga ihe ike. Otu a kwa ndị dị ike na-abagidekwa ya.
MAT 11:13 Nʼihi na tupu Jọn abịa, iwu na ndị amụma niile buru amụma banyere alaeze a.
MAT 11:14 Ọ bụrụkwa na unu jikeere ịnabata ya, ọ bụ ya bụ Ịlaịja ahụ, nke na a ga ịbịa.
MAT 11:15 Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
MAT 11:16 “Gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? Ha dị ka ụmụntakịrị na-egwuri egwu nʼama, ndị na-asị ibe ha,
MAT 11:17 “ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu ekweghị ete egwu. Anyị bụụrụ unu abụ ịkwa ozu, ma unu akwaghị akwa.’
MAT 11:18 Jọn bịara na-erighị achịcha maọbụ ihe ọṅụṅụ. Ha sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’
MAT 11:19 Ma Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ. Ha sị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ abịala, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’ Ma amamihe na-esite nʼọrụ ya gosiri na ihe o mere dị mma.”
MAT 11:20 Mgbe ahụ ọ bidoro ịbụ obodo niile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ọnụ, nʼihi na obodo ndị a echegharịghị.
MAT 11:21 “Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịkwara gị Betsaida. Nʼihi na a sị na ọ bụ nʼime Taịa na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ nʼime unu, ha gaara echegharị ma gosikwa nchegharị ha site nʼiyi uwe mkpe na ikpokwasị onwe ha ntụ nʼisi.
MAT 11:22 Nʼezie asị m unu na ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Taịa na Saịdọn.
MAT 11:23 Ma gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba, ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na a sị na a rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nʼime gị nʼobodo Sọdọm, a garaghị ala ya nʼiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa.
MAT 11:24 Nʼezie asị m unu, ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sọdọm.”
MAT 11:25 Nʼoge ahụ, Jisọs kwuru sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị,nʼihi na ị zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị.
MAT 11:26 E, Nna m, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nʼụzọ dị otu a.
MAT 11:27 “Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya.
MAT 11:28 “Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike.
MAT 11:29 Nyaranụ yokunke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike.
MAT 11:30 Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
MAT 12:1 Nʼoge ahụ, Jisọs sitere nʼubi a kụrụ ọka na-agafe nʼụbọchị izuike. Ma ebe agụụ na-agụ ndị na-eso ụzọ ya, ha malitere ịghọ ogbe ọka, na ịta mkpụrụ ya.
MAT 12:2 Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Lee, ndị na-eso ụzọ gị na-eme ihe na-ezighị ezi ime nʼụbọchị izuike!”
MAT 12:3 Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtaghị ihe Devid na ndị ya na ha soo mere mgbe agụụ na-agụ ha?
MAT 12:4 Otu o si banye nʼụlọ Chineke, ya na ndị so ya, rie achịcha a na-eche nʼihu Chineke, nke na-ezighị ezi nʼiwu ka ha rie, kama ọ dịịrị naanị ndị nchụaja iri ya.
MAT 12:5 Ka ọ bụ na unu agụtabeghị ebe e dere ya nʼime akwụkwọ iwu Mosis na ndị nchụaja na-emerụ ụbọchị izuike nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma ọ dịghị onye na-ata ha ụta?
MAT 12:6 Ma ana m agwa unu na onye dị ukwuu karịa ụlọnsọ ukwu nọ nʼebe a.
MAT 12:7 Ọ bụrụ na unu ghọtara ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’Unu agaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe.
MAT 12:8 Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ụbọchị izuike.”
MAT 12:9 O sitere nʼebe ahụ pụọ banye nʼụlọ nzukọ ha.
MAT 12:10 Nʼebe a ka ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nʼebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ mmadụ nʼụbọchị izuike?”
MAT 12:11 Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu nwere otu atụrụ danyere nʼime olulu nʼụbọchị izuike gịnị ka ọ ga-eme? Ọ ga-ahapụ ya nʼebe ahụ? Ọ gaghị ejide ya dọpụta ya?
MAT 12:12 Mmadụ ọ dịghị mkpa karịa atụrụ? Ya mere, o ziri ezi nʼiwu bụ ịrụ ọrụ ọma nʼụbọchị izuike.”
MAT 12:13 Mgbe ahụ ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” Nwoke ahụ setịpụrụ aka ya. Aka ahụ dịkwara ya mma dị ka aka nke ọzọ.
MAT 12:14 Nʼihi nke a ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ, ga gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya.
MAT 12:15 Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube ime, o sitere nʼebe ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịa nrịa ha niile.
MAT 12:16 Ma o nyere ha iwu ka ha hapụ ịgwa ndị ọzọ onye ọ bụ.
MAT 12:17 Nke a bụ ka emezuo okwu ahụ Aịzaya onye amụma kwuru,
MAT 12:18 “Onye a bụ onye na-ejere m ozi, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nʼanya. O bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye Mmụọ m nʼime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka.
MAT 12:19 Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghị etisikwa mkpu ike. O nweghị onye ga-anụ olu okwu ya nʼezi.
MAT 12:20 Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara nʼala, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị, tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi merie.
MAT 12:21 Ọ bụkwa nʼaha ya ka mba niile dị nʼụwa ga-atụkwasị olileanya ha.”
MAT 12:22 Emesịa, ha kpọtaara ya otu nwoke kpuru ìsì ma daakwa ogbi. Ọ bụkwa onye mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ gwọrọ ya, mee ka nwoke ahụ hụ ụzọ, bidokwa ikwu okwu.
MAT 12:23 Ihe a juru igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ anya. Nʼihi ya, ha kwuru sị, “Nwoke a, ọ ga-abụ Nwa Devid?”
MAT 12:24 Mgbe ndị Farisii nụrụ nke a, ha sịrị, “Nwoke a chụpụrụ mmụọ ọjọọ a nʼihi na Belzebub, eze ndị mmụọ ọjọọ, nyere ya ike ịchụpụ ya.”
MAT 12:25 Ma ebe ọ matara ihe ha na-eche nʼobi ha. Ọ gwara ha okwu sị, “Alaeze ọbụla kewara megide onwe ya ga-ada. Obodo o bụla maọbụ ezinaụlọ ọbụla kewara megide onwe ya agaghị eguzo.
MAT 12:26 Ọ bụrụ na ekwensu achụpụ ekwensu, o kewala megide onwe ya. Oleekwanụ otu alaeze ya ga-esi guzo.
MAT 12:27 Dị ka unu kwuru, ọ bụrụ na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike Belzebub, ọ bụ nʼike onye ka ụmụ unu ndị ikom na-achụpụ ha? Ya mere, ọ bụ ụmụ unu ga-ekpe unu ikpe nʼihi okwu a unu kwuru.
MAT 12:28 Ma ọ bụrụ na m na-esite nʼike Mmụọ nke Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, matakwanụ na alaeze Chineke abịala nʼetiti unu.
MAT 12:29 “Ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo niile dị nʼụlọ ahụ. Ma o nwere ike ime nke a ma ọ bụrụ na ọ ga-eburu ụzọ kee nwoke ahụ agbụ? Mgbe o kesịrị ya agbụ, o nwere ike ịbanye kwakọtaa ngwongwo niile dị nʼụlọ nwoke ahụ.
MAT 12:30 “Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa.
MAT 12:31 Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmehie na nkwulu niile. Ma agaghị agbaghara nkwulu ekwuluru Mmụọ Nsọ.
MAT 12:32 Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwu megide Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya, nʼọgbọ a maọbụ nʼọgbọ nke na-abịa.
MAT 12:33 “Ọ bụrụ na e mee ka osisi too nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọma, ma ọ bụrụ na o toghị nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọjọọ. Nʼihi na a na-amata osisi ọbụla site na mkpụrụ ya.
MAT 12:34 Ụmụ ajụala, olee otu unu ga-esi kwuo okwu dị mma, ebe obi unu dị njọ? Nʼihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nʼobi pụta.
MAT 12:35 Ezi mmadụ na-esi nʼezi akụ ya wepụta ihe dị mma, ma ajọ mmadụ na-esitekwa nʼajọ akụ ya wepụta ajọọ ihe.
MAT 12:36 Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru.
MAT 12:37 Nʼihi na ọ bụ site nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe mara, sitekwa nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe na-amaghị.”
MAT 12:38 Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs sị ya, “Onye nkuzi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe ịrịbama.”
MAT 12:39 Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụ naanị ajọ ọgbọ nke na-enweghị okwukwe ga-achọkwa ka e gosi ha ihe ịrịbama. Ma ọ dịkwaghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịbama Jona onye amụma.
MAT 12:40 Nʼihi na dị ka Jona nọrọ ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼafọ azụ dị ukwuu, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi nọọkwa ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼobi nke ala.
MAT 12:41 Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe. Nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona. Ma lee onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a.
MAT 12:42 Nʼụbọchị ikpe ahụ kwa, eze nwanyị nke Ndịdaga-eso ọgbọ a bilie boo ya ebubo. Ọ ga-amakwa unu ikpe. Nʼihi na o siri nʼebe dị ụwa sọtụrụ bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma ugbu a onye ahụ dị ukwuu karịa Solomọn nọ nʼebe a, ma unu jụrụ i kwere na ya.
MAT 12:43 “Mgbe mmụọ na-adịghị ọcha si nʼime mmadụ pụọ, ọ na-agabiga nʼọzara ebe mmiri na-adịghị ịchọ ebe izuike, ma ọ naghị achọta ya.
MAT 12:44 Mgbe ahụ, ọ na-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m, ebe m si pụta.’ Mgbe ọ lọghachiri, ọ na-achọpụta na a zachara ụlọ ahụ dozie ya, ọ dịkwaghị onye bichiri nʼime ya.
MAT 12:45 Mgbe ahụ, ọ na-apụ gaa chọta mmụọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya onwe ya. Ha niile na-abata bịa biri nʼime onye ahụ. Mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Otu a ka ọ ga-adịrị ndị bi nʼọgbọ a jọrọ njọ.”
MAT 12:46 Mgbe ọ nọ na-agwa igwe mmadụ ahụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara guzoro nʼezi na-eche ka ha gwa ya okwu.
MAT 12:47 Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ gwara ya okwu sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na-achọ ịhụ gị nʼezi. Ha chọrọ ịgwa gị okwu.”
MAT 12:48 Ma ọ zara onye ahụ gwara ya okwu sị, “Onye bụ nne m? Olee ndị bụ ụmụnne m ndị nwoke?”
MAT 12:49 Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka, sị, “Lee, ndị a bụ nne m na ụmụnne m ndị nwoke.
MAT 12:50 Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe Nna m bi nʼeluigwe chọrọ, bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, nakwa nne m.”
MAT 13:1 Nʼotu ụbọchị ahụ, Jisọs hapụrụ ụlọ ahụ gaa nʼọnụ mmiri ebe ọ nọdụrụ ala.
MAT 13:2 Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya, nke mere ka ọ baa nʼime ụgbọ mmiri. Nʼime ya ka ọ nọ na-ezi ndị mmadụ nọ nʼọnụ mmiri ahụ na-ege ya ntị ihe.
MAT 13:3 O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịkụ mkpụrụ nʼubi ya.
MAT 13:4 Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime ha dara nʼakụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrịa ha loo.
MAT 13:5 Ma ụfọdụ nʼime ha dara nʼala dị nkume nkume. Ọ dịghị anya ha puputara, too, nʼihi na aja dị nʼebe ahụ emighị emi.
MAT 13:6 Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, nʼihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu nʼime ala.
MAT 13:7 Mkpụrụ ụfọdụ danyere nʼetiti ogwu, ogwu ahụ topụtara kpagbuo ha.
MAT 13:8 Ma ụfọdụ mkpụrụ dara nʼezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị mkpụrụ iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ kwa otu narị.
MAT 13:9 Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
MAT 13:10 Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji na-agwa ndị a okwu nʼilu?”
MAT 13:11 Ọ zaghachiri, “Nʼihi na ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze eluigwe. Emeghị ka ndị ọzọ ghọta ya.
MAT 13:12 Onye ahụ nwere ihe ka a ga-enyekwa ọzọ, ka o nwee karịa. Ma onye na-enweghị ihe ọbụla ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe o nwere.
MAT 13:13 Nke a bụ ihe mere m ji agwa ha okwu nʼilu: “Nʼihi na ha na-ele anya, ma ha adịghị ahụ ụzọ, ha na-ege ntị, ma ha adịghị anụ ihe maọbụ aghọta ya.
MAT 13:14 Nke a bụkwa imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “ ‘Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla. Unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.
MAT 13:15 Nʼihi na obi ndị nke a a maala abụba, dịkwa arọ, ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe, sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’
MAT 13:16 Ma ngọzị na-adịrị anya unu, nʼihi na ha na-ahụ ụzọ, na ntị unu nʼihi na ha na-anụkwa ihe.
MAT 13:17 Nʼezie agwa m unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ, ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya.
MAT 13:18 “Ugbu nụrụnụ nkọwa ilu ọgha mkpụrụ ahụ.
MAT 13:19 Mgbe onye ọbụla nụrụ oziọma nke alaeze ahụ, ma ọ ghọtaghị ya, ajọ onye ahụ na-abịa napụ ya ihe ahụ akụrụ nʼobi ya. Nke a bụ mkpụrụ ahụ nke dara nʼokporoụzọ.
MAT 13:20 Mkpụrụ nke dara nʼala nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, jirikwa oke ọṅụ nabata ya.
MAT 13:21 Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ.
MAT 13:22 Mkpụrụ nke dara nʼala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nʼakụ nke ụwa a, kpagidere okwu dị nʼime ya, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ.
MAT 13:23 Ma mkpụrụ dara nʼala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nʼoziọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-amịta mkpụrụ dị narị, maọbụ iri isii, maọbụ iri atọ karịa ihe akụnyere nʼime ya.”
MAT 13:24 Ọ tụụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka mmadụ ọbụla nke kụrụ ezi mkpụrụnʼubi ya.
MAT 13:25 Ma nʼotu abalị, mgbe onye ọbụla nọ nʼụra, onye iro gara nʼubi ahụ kụọ mkpụrụ na-epu ahịhịa nʼetiti ezi mkpụrụ ọka wiiti ahụ ọ kụrụ ma laa.
MAT 13:26 Mgbe mkpụrụ ọka wiiti ndị ahụ puputara, mepụta isi ọka, ahịhịa ahụ bidokwara ito.
MAT 13:27 “Ndị ọrụ onye nwe ubi ahụ bịara sị ya, ‘Nna anyị ukwu, ọ bụghị ezi mkpụrụ ọka ka ị kụrụ nʼubi gị? Ebeekwanụ ka ahịhịa ndị a si bịa?’
MAT 13:28 “Onye ọrụ ubi ahụ zara ha sị, ‘Ọ bụ onye iro m kụrụ ahịhịa ndị a.’ “Ndị ọrụ ya jụrụ ya sị, ‘Ị chọrọ ka anyị gaa fopụtasịa ha?’
MAT 13:29 “Ma onye ọrụ ubi ahụ sịrị ha, ‘Ọ dịghị, nʼihi na mgbe unu na-achọ ihopu ahịhịa ndị ahụ, unu nwere ike site na-amaghị ama hopu ezi mkpụrụ ọka wiiti.
MAT 13:30 Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ na-etokọta, tutu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. Nʼoge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunu ụzọ chịkọtasịa ahịhịa ndị a niile, kee ha nʼukwu nʼukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpokọtanụ ọka wiiti ndị a tinye ha nʼọba m.’ ”
MAT 13:31 Ọ tụkwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọstaadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nʼubi ya.
MAT 13:32 Ọ bụ ezie na ọ bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta karịa mkpụrụ ubi niile, ma mgbe mkpụrụ a toro, ọ na-adị ukwuu karịa ihe niile a kụrụ nʼubi. Ọ na-aghọ osisi buru ibu, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.”
MAT 13:33 Ọ tụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka ihe na-eko achịcha,nke nwanyị na-ewere gwakọta nʼụtụ ọka e ji eme achịcha, tutu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ niile koo.”
MAT 13:34 Oge niile ka Jisọs na-eji ilu na-agwa ndị mmadụ ndị a okwu. O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu.
MAT 13:35 O mere nke a ka okwu onye amụma kwuru mezuo, sị, “Aga m eji ilu kwuo okwu mgbe m na-agwa ha okwu. Aga m agwakwa ha ihe mmadụ ọbụla na-amaghị site nʼoge e kere ụwa.”
MAT 13:36 Emesịa, ọ hapụrụ igwe mmadụ ahụ baa nʼụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu ahụ ị tụrụ pụtara, ilu banyere ahịhịa puru nʼubi a kụrụ ọka.”
MAT 13:37 Jisọs zara ha sị, “Nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ahụ bụ Nwa nke Mmadụ.
MAT 13:38 Ubi ahụ a ghanyere mkpụrụ ndị ahụ bụ ụwa. Mkpụrụ nke a kụrụ nʼubi ahụ nọchiri anya ụmụ nke alaeze ahụ. Ahịhịa ahụ puru nʼubi ahụ nọchikwara anya ụmụ ajọ onye ahụ.
MAT 13:39 Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi.
MAT 13:40 “Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ.
MAT 13:41 Nwa nke Mmadụ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha gaa site nʼalaeze ya fopụtasịa ihe niile na-eme ka e mee mmehie, na ndị niile na-eme ajọ ihe.
MAT 13:42 Ha ga-atụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze.
MAT 13:43 Ma ndị niile bụ ndị ezi omume ga-enwu dị ka anyanwụ nʼime alaeze Nna ha. Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
MAT 13:44 “Alaeze eluigwe dị ka akụ e zoro nʼubi, nke otu nwoke chọpụtara zookwa ya ọzọ. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe niile o nwere, ma gaa zụta ubi ahụ.
MAT 13:45 “Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara.
MAT 13:46 Mgbe ọ hụrụ nkume a, o ree ihe niile o nwere, were ego ya gaa zụrụ nkume a dị oke ọnụahịa.
MAT 13:47 “Ọzọkwa, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ e ji egbu azụ, nke a wụnyere nʼime osimiri, jiri ya jide azụ dị iche iche.
MAT 13:48 Mgbe ụgbụ a juru, ndị ọkụ azụ ahụ na-adọpụta ya. Nọdụ ala họpụtasịa ndị dị mma tinye ha nʼime nkata, ma tufuo ndị na-adịghị mma.
MAT 13:49 Otu a ka ọ ga-adị nʼọgwụgwụ oge. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nʼetiti ndị ezi omume,
MAT 13:50 ma tụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ. Ebe ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze.”
MAT 13:51 Ọ jụrụ ha sị, “Unu ghọtara ihe ndị a m na-ekwu?” Ha zara sị ya, “E.”
MAT 13:52 Ọ sịrị ha, “Nʼihi nke a, onye nkuzi nke iwu ọbụla nke e mere ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ alaeze eluigwe, dị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nʼụlọakụ ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.”
MAT 13:53 Mgbe Jisọs tụsịrị ilu ndị a, o si ebe ahụ pụọ.
MAT 13:54 O rutere nʼobodo ya, malite izi ha ihe nʼụlọ ekpere ha, nke a jukwara ha anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a niile?
MAT 13:55 Nwoke a, ọ bụghị nwa onye kapinta? Ọ bụ na-adịghị akpọ nne ya Meri? Jemis, Josef, Saimọn na Judas, ha abụghị ụmụnne ya ndị ikom?
MAT 13:56 Ụmụnne ya ndị inyom niile, ha anọghị nʼetiti anyị? Olee ebekwa ka nwoke a si nweta ihe ndị a?”
MAT 13:57 Iwe were ha nʼebe ọ nọ. Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nʼebe niile, ma a dịghị asọpụrụ ya nʼobodo a mụrụ ya, nakwa nʼezinaụlọ nke ya.”
MAT 13:58 Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nʼebe ahụ, nʼihi na ha enweghị okwukwe nʼime ha.
MAT 14:1 Nʼoge a Herọd eze na-achị Galili nụrụ ihe banyere Jisọs.
MAT 14:2 Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Onye a bụkwanụ Jọn omee baptizim. O sitela na ndị nwụrụ anwụ bilie dịkwa ndụ ọzọ. Ọ bụ ya mere ike ịrụ ọrụ ebube ndị a ji dị nʼime ya.”
MAT 14:3 Nʼihi na, Herọd jidere Jọn kee ya agbụ tinye ya nʼụlọ mkpọrọ, nʼihi Herodịas nwunye Filip nwanne ya nwoke.
MAT 14:4 Nʼihi na Jọn gwara ya, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ ya.”
MAT 14:5 Herọd chọrọrị igbu ya, ma ọ tụrụ egwu ndị mmadụ, nʼihi na ha weere Jọn dị ka onye amụma.
MAT 14:6 Ma mgbe a na-eme mmemme icheta ọmụmụ Herọd, ada Herodịas tere egwu nʼihu Herọd, na nʼihu ndị ọbịa bịara nʼụbọchị ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu.
MAT 14:7 Nke a mere o ji ṅụọ iyi kwee nkwa inye ya ihe ọbụla ọ rịọrọ.
MAT 14:8 Ma dị ka nne ya si haziere ya, ọ rịọrọ eze Herọd sị, “Nye m isi Jọn omee baptizim nʼefere ugbu a.”
MAT 14:9 Arịrịọ a wutere eze Herọd, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ na nʼihi ndị ọbịa ya niile, ọ chọghị ịla azụ nʼokwu ya. O nyere iwu ka e meere ya ihe ọ chọrọ.
MAT 14:10 O ziri ozi ka e bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ.
MAT 14:11 E tinyere isi ya nʼefere bunye nwaagbọghọ ahụ. Ọ naara ya bulaara nne ya.
MAT 14:12 Ndị na-eso ụzọ ya bịara buru ozu ya gaa lie. Ha gara kọọrọ Jisọs ihe mere.
MAT 14:13 Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma mgbe igwe mmadụ nụrụ ya, ha si obodo dị iche iche sooro ya nʼukwu ala.
MAT 14:14 Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri ahụ rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, gwọọ ndị ọrịa nʼetiti ha.
MAT 14:15 Nʼoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Chi na-achọ iji. Ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nʼọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nʼime obodo zụọra onwe ha nri.”
MAT 14:16 Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie.”
MAT 14:17 Ha zara ya sị, “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka anyị nwere.”
MAT 14:18 Ọ sịrị ha, “Wetaranụ m ha nʼebe a.”
MAT 14:19 Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ.
MAT 14:20 Onye ọbụla riri rijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe achịcha dara nʼala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ.
MAT 14:21 Ma ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke ise, nʼagụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụntakịrị.
MAT 14:22 Mgbe nke a gasịrị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nʼụgbọ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ.
MAT 14:23 Mgbe ọ zilagasịrị igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere, naanị ya. Mgbe oge anyasị ruru, naanị ya nọkwa na-ebe ahụ.
MAT 14:24 Ma nʼoge a ụgbọ mmiri ahụ esitela nʼebe ala dị nso gamie nʼelu osimiri, ebili mmiri na-ebugharịkwa ya, nʼihi na ifufe ahụ na-emegide ya.
MAT 14:25 Ma ihe dị ka site nʼelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, na-aga ije nʼelu osimiri.
MAT 14:26 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri ahụ, obi lọrọ ha mmiri, ha sị, “Ọ bụkwanụ mmụọ o!” Ha tiri mkpu nʼihi egwu.
MAT 14:27 Ma ngwangwa Jisọs sịrị ha, “Nweenụ obi ike! O bụ m; unu atụla egwu.”
MAT 14:28 Pita zara ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, sị m bịakwute gị nʼelu mmiri.”
MAT 14:29 Ọ sịrị ya, “Bịa!” Pita sitere nʼụgbọ ahụ pụta, bido ịga ije nʼelu mmiri ijekwuru Jisọs.
MAT 14:30 Ma mgbe ọ hụrụ oke ebili mmiri ahụ ka ọ na-amagharị; egwu tụrụ ya. Ma mgbe ọ malitere imikpu nʼime mmiri ahụ, o tiri mkpu sị, “Onyenwe m! Zọpụta m!”
MAT 14:31 Na-atụfughị oge, Jisọs setịpụrụ aka ya dọpụta Pita. Ọ sịrị ya, “Gị onye okwukwe nta, nʼihi gịnị ka i ji nwee obi abụọ!”
MAT 14:32 Ma mgbe ha rịbanyere nʼime ụgbọ ahụ ifufe ahụ kwụsịkwara.
MAT 14:33 Ndị ahụ nọ nʼụgbọ ahụ kpọrọ isiala nye ya sị, “Nʼezie, ị bụ Ọkpara Chineke.”
MAT 14:34 Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha bịarutere nʼala Genesaret.
MAT 14:35 Mgbe ndị obodo ahụ matara na ọ bụ ya, ha zisara ozi gburugburu obodo niile ahụ, ma dutere ya ndị niile ahụ na-adịghị ike.
MAT 14:36 Ha rịọrọ ya ka o kwenye ka ha metụ ọ bụladị ọnụ uwe ya aka. Ndị niile metụrụ ya aka ka a gwọrọ.
MAT 15:1 Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu si Jerusalem bịakwute Jisọs jụrụ ya ajụjụ sị,
MAT 15:2 “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị erube isi nʼomenaala ndị okenye? Ha anaghị akwọ aka ha tupu ha erie nri.”
MAT 15:3 Ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ada iwu Chineke nʼihi omenaala unu?
MAT 15:4 Nʼihi na Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nna maọbụ nne ya ka e gbuo ya.’
MAT 15:5 Ma unu na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla ga-asị nna maọbụ nne ya, ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ ‘onyinye dịrị Chineke.’
MAT 15:6 Nʼihi ya, ha agaghị eji ya asọpụrụ nna ha maọbụ nne ha. Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu nʼihi omenaala unu.
MAT 15:7 Ndị ihu abụọ! Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu bụ eziokwu. Mgbe o kwuru sị,
MAT 15:8 “ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.
MAT 15:9 Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’ ”
MAT 15:10 Mgbe ahụ, ọ kpọrọ igwe mmadụ ahụ, sị ha, “Geenụ ntị, ghọtakwanụ.
MAT 15:11 Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nʼọnụ na-emerụ ya, kama ọ bụ ihe sị nʼọnụ onye ahụ pụta na-emerụ ya.”
MAT 15:12 Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Ị makwa na obi adịghị ndị Farisii mma nʼihi okwu ahụ i kwuru?”
MAT 15:13 Ma ọ zara sị ha, “Osisi ọbụla Nna m nke eluigwe na-ejighị aka ya kụọ ka a ga-ehopu.
MAT 15:14 Ya mere, unu echegbula onwe unu, nʼihi na ha bụ ndị ndu kpuru ìsì. Ma ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì ibe ya ha abụọ adaba nʼime olulu.”
MAT 15:15 Pita sịrị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu a pụtara.”
MAT 15:16 Ọ jụrụ ha sị, “Unu ọ ka dị ka ndị na-enweghị nghọta?
MAT 15:17 Ọ bụ na unu aghọtaghị na ihe ọbụla nke na-aba nʼọnụ na-aga nʼime afọ, sịkwa nʼebe ahụ a nyụpụ ya nʼụlọ nsị?
MAT 15:18 Ma ihe si mmadụ nʼọnụ pụta na-esi ya nʼobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ.
MAT 15:19 Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko niile, ịkwa iko nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwulu.
MAT 15:20 Ihe ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ, ọ bụghị ma mmadụ kwọrọ aka tupu o rie nri, maọbụ na ọ kwọghị.”
MAT 15:21 Jisọs hapụrụ obodo ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa na Saịdọn.
MAT 15:22 Nʼebe ahụ, otu nwanyị onye Kenan bi nʼobodo ahụ bịakwutere ya rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nwa Devid, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nʼime ya nke na-esogbu ya oge niile.”
MAT 15:23 Ma ọ gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya rịọ ya sị ya, “Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si eti mkpu na-esogharị anyị!”
MAT 15:24 Ọ zara sị, “Ezitere m naanị ijekwuru atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.”
MAT 15:25 Ma ọ bịara daa nʼụkwụ ya rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nyere m aka!”
MAT 15:26 Ọ zara sị, “O zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.”
MAT 15:27 Ọ zara sị, “Ọ bụ eziokwu Onyenwe m. Ma a na-ekwekwa ka ụmụ nkịta nọ nʼokpuru tebul rie iberibe nri nke na-esi nʼelu tebul ha daa nʼala.”
MAT 15:28 Jisọs zara sị ya, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meelara gị ihe ị na-arịọ.” Nʼotu oge ahụ a gwọrọ ada ya.
MAT 15:29 Jisọs hapụrụ ebe ahụ lọghachi nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ rịgooro nʼelu ugwu nọdụ ala.
MAT 15:30 Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka ha na ndị ụkwụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Ha tọgbọrọ ha nʼụkwụ ya, ọ gwọkwara ha niile.
MAT 15:31 Ọ tụrụ mmadụ niile nʼanya mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka ha, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, o jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izrel.
MAT 15:32 Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a obi ebere, nʼihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ nʼebe a, ma ha eribeghị nri ọbụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nʼihi na ha nwere ike ịda nʼụzọ.”
MAT 15:33 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru igwe mmadụ ndị a nʼọzara a?”
MAT 15:34 Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị ya, “Ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole.”
MAT 15:35 Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala.
MAT 15:36 O weere ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. Ọ nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ.
MAT 15:37 Onye ọbụla nʼime ha riri, rijuo afọ. Ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara iberibe ndị fọdụrụ nke juru nkata asaa.
MAT 15:38 Ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke anọ, nʼagụnyeghị ndị nwanyị na ụmụntakịrị.
MAT 15:39 Mgbe o zilagara igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gafee osimiri, bịaruo nʼobodo Magadan.
MAT 16:1 Ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ha gwara ya sị, “Gosi anyị ihe ịrịbama si nʼeluigwe.”
MAT 16:2 Ọ zara ha, “Mgbe o ruru anyasị unu na-asị, ‘Ihu eluigwe ga-adị mma nʼihi na ọ na-acha uhie uhie.’
MAT 16:3 Nʼụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nʼihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie ma na-eji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nʼihe ịrịbama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nʼime ya pụtara.
MAT 16:4 Ajọ ọgbọ nke jupụtara nʼịkwa iko, nke na-arịọkwa ihe ịrịbama. Ọ nweghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi ya karịa ihe ịrịbama Jona.” Mgbe ahụ ọ sitere nʼebe ahụ ha nọ pụọ.
MAT 16:5 Mgbe ha gafesịrị nʼofe ọzọ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha ejighị achịcha ọbụla.
MAT 16:6 Nʼoge ahụ kwa, Jisọs dụrụ ha ọdụ sị ha, “Lezienụ anya, ma na-ezekwa ihe ndị na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii.”
MAT 16:7 Ha malitere na-ekwurịta nʼetiti onwe ha, na-asị, ọ bụ nʼihi na anyị ewetaghị ogbe achịcha ọbụla.
MAT 16:8 Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche, ọ sịrị, “Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nʼihi na unu enweghị achịcha?
MAT 16:9 Olee mgbe unu ga-amata ihe? Ọ bụ na unu echetaghị puku mmadụ ise ahụ m jiri ogbe achịcha ise mee ka ha rijuo afọ? Ọ bụ nkata ole ka unu tụtụjuru?
MAT 16:10 Unu echetakwaghị na m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ? Iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?
MAT 16:11 Gịnị mere unu aghọtaghị na ọ bụghị ihe banyere achịcha ka m na-ekwu? Cheenụ onwe unu nche nʼebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ.”
MAT 16:12 Mgbe ahụ ka ha ghọtara na ihe ọ na-akọwara ha abụghị ihe banyere ihe na-eko achịcha nke a na-ata ata, kama ọ bụ ihe banyere ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii.
MAT 16:13 Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipai, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?”
MAT 16:14 Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, maọbụ otu nʼime ndị amụma.”
MAT 16:15 Ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?”
MAT 16:16 Saimọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.”
MAT 16:17 Jisọs gwara ya sị, “Saimọn Pita nwa Jona, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya.
MAT 16:18 Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita.Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya.
MAT 16:19 Aga m enye gị mkpisi igodo alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ nʼelu ụwa, ka a ga-ekekwa agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ nʼagbụ nʼụwa, a ga-atọpụkwa ya nʼeluigwe.”
MAT 16:20 Mgbe ahụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka onye ọbụla mata na ya bụ Kraịst ahụ.
MAT 16:21 Site nʼoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya, na ya aghaghị ịga Jerusalem, ebe ọ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche site nʼaka ndị okenye, na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu. O mere ka ha mata na aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.
MAT 16:22 Pita duuru ya pụọ nʼotu akụkụ, nọdụ nʼebe ahụ baara ya mba sị ya, “Onyenwe m, Chineke ekwela. Ihe ndị a agaghị adakwasị gị!”
MAT 16:23 Ma o chigharịrị sị Pita, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu! Ị bụ ihe mgbochi nye m. Nʼihi na ihe ị na-eche echiche ya bụ naanị echiche mmadụ, ọ bụghị uche Chineke.”
MAT 16:24 Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buru obe ya, soro m nʼazụ.
MAT 16:25 Nʼihi na onye ọbụla na-eche ndụ ya nche ka ọ hapụ ifunarị ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-achọtakwa ya.
MAT 16:26 Nʼihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya? Maọbụ gịnị bụ ihe ahụ dị nʼụwa nke mmadụ ga-eji gbanwee ndụ ya?
MAT 16:27 Nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.
MAT 16:28 “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe, agaghị edetụ ọnwụ ire, tụpụ ha ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼalaeze ya.”
MAT 17:1 Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn nwanne ya, rigoro nʼugwu dị elu ebe naanị ha nọdụrụ.
MAT 17:2 Nʼebe ahụ a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha, ihu ya na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya chapụkwara dị ka ìhè.
MAT 17:3 Nʼotu ntabi anya ahụ, ha hụrụ Mosis na Ịlaịja ka ha na ya na-ekwurịta okwu.
MAT 17:4 Mgbe ahụ Pita sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị. Ọ dị mma ka anyị niile nọdụ nʼebe a. Ọ bụrụ na ị ga-enye m ike, aga m ewu ụlọ ikwu atọ nʼebe a. Otu nʼime ụlọ ndị a ga-abụ nke gị, otu nke Mosis, nke ọzọ nke Ịlaịja.”
MAT 17:5 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii nke na-enwu enwu kpuchiri ha, olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma. Geenụ ya ntị.”
MAT 17:6 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ olu a, ha dara nʼala nʼihi egwu.
MAT 17:7 Ma Jisọs jekwuuru ha metụ ha aka sị ha, “Bilienụ, unu atụla egwu.”
MAT 17:8 Mgbe ha lelitere anya ha, o nwekwaghị onye ọzọ ha hụrụ ma ọ bụghị naanị Jisọs.
MAT 17:9 Ma mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu, sị, “Unu agwala onye ọbụla ihe unu hụrụ tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie.”
MAT 17:10 Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji na-ekwu na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”
MAT 17:11 Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja na-abịa, ọ ga-emekwa ka ihe niile dị ka ọ dị na mbụ.
MAT 17:12 Ma Ịlaịja abịalarị, ma ndị mmadụ amataghị ya. Kama ndị mmadụ emeela ya ihe ọjọọ dị iche iche. Otu a kwa ka mụ onwe m bụ Nwa nke Mmadụ ga-esi ahụ ahụhụ site nʼaka ha.”
MAT 17:13 Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ bụ Jọn omee baptizim ka ọ na-ekwu banyere ya.
MAT 17:14 Mgbe ha bịarutere nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere ya gbuo ikpere nʼihu ya,
MAT 17:15 rịọọ ya sị, “Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nʼihi na akwụkwụ na-adọ ya. Ọ na-ata oke ahụhụ, ọtụtụ mgbe ọ na-adaba nʼime ọkụ maọbụ nʼime mmiri.
MAT 17:16 Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma.”
MAT 17:17 Jisọs zara sị, “Unu ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtaranụ m nwata ahụ nʼebe a.”
MAT 17:18 Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nʼime nwata ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, nwata ahụ bụ onye agwọkwara nʼotu oge ahụ.
MAT 17:19 Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, “Gịnị mere o ji siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?”
MAT 17:20 Ọ sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na okwukwe unu nwere esighị ike. Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe nke dị nta ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị ugwu a, ‘Site nʼebe a wezuga onwe gị,’ ọ ga-apụtakwa. Ọ dịghị ihe unu na-agaghị enwe ike ime.
MAT 17:21 Ma mmụọ ọjọọ dị otu a agaghị apụ, ma ọ bụghị naanị site nʼikpe ekpere na ibu ọnụ.”
MAT 17:22 Mgbe ha gbakọrọ na Galili, Jisọs gwara ha sị, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmadụ.
MAT 17:23 Ha ga-egbukwa ya, ma nʼụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si nʼọnwụ bilie.” Nke a wutere ha nke ukwuu.
MAT 17:24 Mgbe ha bịaruru na Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nʼihi ụlọnsọ bịakwutere Pita jụọ ya sị, “Onye ozizi unu ọ dịghị atụ ụtụ ụlọnsọ?”
MAT 17:25 Pita zara ha sị, “E, ọ na-atụ ụtụ.” Mgbe ọ batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? Ọ bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? Ọ bụ nʼaka ụmụ ha, ka ọ bụ nʼaka ndị ọbịa?”
MAT 17:26 Ma mgbe Pita zara ya sị, “Ọ bụ site nʼaka ndị ọbịa.” Jisọs sịrị ya, “Ọ dị mma. Iwu ejighị ndị bụ ụmụ.
MAT 17:27 Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”
MAT 18:1 Nʼoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ajụjụ sị, “Olee onye dị ukwuu karịa ibe ya nʼalaeze eluigwe?”
MAT 18:2 Ọ kpọrọ otu nwantakịrị, onye o mere ka o guzoro nʼetiti ha,
MAT 18:3 ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu agbanweghị ma dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba nʼalaeze eluigwe.
MAT 18:4 Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe.
MAT 18:5 Onye ọbụla nabatara nwantakịrị dị otu a nʼihi m, bụ onye nabatara m.
MAT 18:6 “Ma ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu emee ka otu nʼime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, jehie nʼokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume igwe nri nʼolu, tụnye ya nʼoke osimiri ka mmiri rie ya.
MAT 18:7 Ahụhụ ga-adịrị ụwa nʼihi ihe ndị na-eme ka mmadụ jehie. Ihe ndị na-eme ka mmadụ daba nʼọnwụnwa aghaghị ịbịa, ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ọ ga-esite nʼaka ya bịa.
MAT 18:8 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na aka gị maọbụ ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufukwaa ya. Ọ kaara gị mma inwe ọrụsị maọbụ daa ngwụrọ baa na ndụ, karịa na ị ga-enwe aka abụọ maọbụ ụkwụ abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ebighị ebi.
MAT 18:9 Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa na ndụ, karịa inwe anya abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ.
MAT 18:10 “Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nʼime ụmụntakịrị ndị a anya. Nʼihi na nʼeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nʼihu Nna m mgbe niile.
MAT 18:11 Nʼihi na Nwa nke mmadụ bịara ịzọpụta ndị furu efu.
MAT 18:12 “Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na ọ dị onye nwere narị atụrụ, ma otu nʼime ha akpafuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu fọdụrụ pụọ jegharịa nʼugwu na ndịda niile, ịchọ atụrụ ahụ kpafuru akpafu?
MAT 18:13 Ọ bụrụkwa na ọ chọta ya, gịnị ka ọ ga-eme? Nʼezie, agwa m unu, ọ ga-aṅụrị oke ọnụ nʼihi otu atụrụ a karịa iri atụrụ itoolu na itoolu ndị ọzọ ahụ na-agahieghị ụzọ.
MAT 18:14 Ya mere, ọ bụghị nzube Nna m nke bi nʼeluigwe ka otu nʼime ụmụnta ndị a ala nʼiyi.
MAT 18:15 “Ọ bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jekwuru ya ebe naanị gị na ya nọ, tụọ ya mmehie nʼanya. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritela nwanna gị nʼuru.
MAT 18:16 Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye maọbụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nʼebe ọ nọ, ‘ka okwu ọbụla ekwuru bụrụ nke mmadụ abụọ maọbụ atọ ga-agba akaebe banyere ya.’
MAT 18:17 Ọ bụrụ na o geghị ha ntị, gwa ndị chọọchị, ma ọ bụrụ na o geghịkwa ọ bụladị ndị chọọchị ntị, were ya dị ka onye mba ọzọ maọbụ onye ọna ụtụ.
MAT 18:18 “Nʼezie, asị m unu, na ihe ọbụla unu kere agbụ nʼụwa a, e keela ya rịị agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla kwa unu tọpụrụ nʼụwa, a tọpụkwala ya rịị nʼeluigwe.
MAT 18:19 “Ọzọ, ana m agwa unu nʼezie a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nʼetiti unu ekwekọrịta nʼụwa banyere ihe ọbụla unu na-arịọ nʼekpere Nna m bi nʼeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ.
MAT 18:20 Nʼihi na ebe ọbụla mmadụ abụọ maọbụ atọ zukọtara nʼaha m, mụ onwe m nọ nʼetiti ha.”
MAT 18:21 Mgbe ahụ Pita bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugboro ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ bụ ugboro asaa?”
MAT 18:22 Jisọs zara sị ya, “Ọ bụghị ugboro asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa ụzọ asaa.
MAT 18:23 “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị ọrụ ya gụzie ego ya ha ji.
MAT 18:24 Mgbe ha malitere na-apịazi, a kpọtaara eze ahụ otu onye nke ji ya ụgwọ ruru puku talenti iri.
MAT 18:25 Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Nna ya ukwu nyere iwu ka e refuo ya na nwunye ya na ụmụ ya, na ihe niile o nwere, ka akwụghachi ụgwọ o ji.
MAT 18:26 “Ma ohu ahụ dara nʼala, gbukwaa ikpere ya nʼala, rịọ ya arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachiobi nʼebe m nọ. Aga m akwụghachikwa gị ụgwọ niile m ji gị.’
MAT 18:27 Nna ukwu onye ọrụ ahụ nwere ọmịiko nʼebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ.
MAT 18:28 “Ma mgbe ohu ahụ sitere nʼebe ahụ pụọ, ọ hụrụ otu ohu ibe ya ji ya ụgwọ otu narị denarị.O jidere ya nʼaka ike, machie ya aka nʼakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a.’
MAT 18:29 “Ya mere, ohu ibe ya ahụ dara nʼala nʼihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Enyi m, biko nwee ntachiobi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’
MAT 18:30 “Ma o kwenyeghị, kama ọ gara tụba ya nʼụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ niile o ji ya.
MAT 18:31 Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe mere, o wutere ha nke ukwuu. Ha jekwuru Nna ha ukwu kọọrọ ya ihe niile ndị a.
MAT 18:32 “Nʼihi nke a Nna ya ukwu kpọrọ ohu ahụ sị ya, ‘Ohu obi ọjọọ! Agbaghara m gị ụgwọ ahụ niile i ji, nʼihi na ị rịọrọ m arịrịọ.
MAT 18:33 Ọ bụ na ị kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere?’
MAT 18:34 Nʼihi iwe, Nna ya ukwuu nyefere ya nʼaka ndị nche na-eche ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ, ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji.
MAT 18:35 “Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu.”
MAT 19:1 Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judịa, nke dị nʼofe osimiri Jọdan.
MAT 19:2 Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nʼetiti ha nʼebe ahụ.
MAT 19:3 Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya i nwalee ya, sị, “O ziri ezi nʼiwu na nwoke ga-agbara nwunye ya alụkwaghị m nʼihi ihe ọbụla?”
MAT 19:4 Ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtabeghị na akwụkwọ nsọ, na Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.
MAT 19:5 Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ.
MAT 19:6 Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”
MAT 19:7 Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mekwaranụ Mosis ji nye iwu si na nwoke ọbụla nwere ohere ide akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya?”
MAT 19:8 Ọ zara ha sị ha, “Ọ bụ nʼihi na unu bụ ndị mkpọchi obi, ya mere Mosis jiri hapụ unu ka unu gbaa nwunye unu alụkwaghị m; ma ọ dịghị otu a site na mbụ.
MAT 19:9 Ma ana m asị unu, onye ọbụla ga-ahapụ nwunye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nʼihi na o jidere nwunye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ.”
MAT 19:10 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwunye ma ọlị.”
MAT 19:11 Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ niile ga-anagide okwu a. Naanị ndị e nyere ike ime ya ga-anagide ya.
MAT 19:12 Ma ụfọdụ ndị mmadụ ka a mụrụ ka ha bụrụ onozi, ndị ọzọ bụkwa ndị mmadụ ibe ha mere otu a. Ndị ọzọ dịkwa ndị jiri aka ha họrọ ibu onozinʼihi alaeze eluigwe. Onye pụrụ ịnara nke a, ya nara ya.”
MAT 19:13 Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba.
MAT 19:14 Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.”
MAT 19:15 O bikwasịrị ha aka nʼisi gọzie ha niile tupu ọ hapụ ha pụọ.
MAT 19:16 Otu onye bịakwutere ya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?”
MAT 19:17 Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji ajụ m ajụjụ banyere ihe bụ ezi ihe? Ọ dị naanị otu onye nke bụ ezi mmadụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịba nʼime ndụ ahụ, debe iwu niile e nyere.”
MAT 19:18 Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara ya, “ ‘Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha.
MAT 19:19 Sọpụrụ nne gị na nna gị.Ọzọ, hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’”
MAT 19:20 Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Edebezuchaala m iwu ndị a siterịị na mgbe m dị na nwata. Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?”
MAT 19:21 Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m.”
MAT 19:22 Mgbe nwokorobịa ahụ nụrụ okwu a, ọ lara na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya.
MAT 19:23 Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze eluigwe.
MAT 19:24 Ọzọkwa, asị m unu, ọ dịịrị ịnyịnya kamel mfe ịgafe nʼanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.”
MAT 19:25 Okwu a o kwuru tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”
MAT 19:26 Jisọs legidere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ.”
MAT 19:27 Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile soro gị, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ anyị?”
MAT 19:28 Jisọs zara sị ya, “Nʼezie agwa m unu, mgbe a ga-agbanwe ihe niile, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-anọkwasị nʼelu ocheeze ebube ya, nʼalaeze ahụ, nʼezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nʼocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.
MAT 19:29 Onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, na ụmụnne ya nwoke, na ụmụnne ya nwanyị, na nne ya na nna ya, na ụmụntakịrị ya, maọbụ ala o nwere, soro m, ga-anata dị ka ụgwọ ọrụ okpukpu narị ihe ọ hapụrụ, natakwa alaeze. Ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.
MAT 19:30 Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.”
MAT 20:1 “Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nʼisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nʼubi vaịnị ya.
MAT 20:2 Ya na ndị ọrụ ahụ kwekọtara na ọ ga-akwụ ha otu denarị, nʼihi ọrụ ụbọchị ahụ. Emesịa o zigara ha nʼubi vaịnị ya.
MAT 20:3 “Mgbe ọ pụrụ nʼihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, o sitere nʼebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro nʼọma ahịa na-enweghị ọrụ ha na-arụ.
MAT 20:4 Ọ sịrị ha, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m, ihe ọbụla ziri ezi ka m ga-akwụ unu.’
MAT 20:5 Ya mere ha gara. “Ọ pụkwara nʼelekere iri na abụọ na elekere atọ nke ehihie, ma meekwa otu ihe ahụ.
MAT 20:6 Mgbe o ruru elekere ise nke anyasị, ọ pụrụ hụ ndị ọzọ ka ha guzoro. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere unu ji guzoro nʼebe a taa niile na-arụghị ọrụ?’
MAT 20:7 “Ha zara sị ya, ‘Nʼihi na ọ dịghị onye kpọrọ anyị ọrụ.’ “Ọ gwara ha sị, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m. Aga m akwụkwa unu ihe dị mma.’
MAT 20:8 “Mgbe o ruru oge anyasị, onye nwe ubi vaịnị ahụ gwara onye na-elekọtara ya ndị ahụ anya sị, ‘Kpọkọta ndị ọrụ ahụ kwụọ ha ụgwọ, site na ndị ikpeazụ bịara ọrụ ruo na ndị bu ụzọ.’
MAT 20:9 “Mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼelekere ise anyasị naara ego ha, a kwụrụ ha otu denarị, otu denarị.
MAT 20:10 Ma mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼisi ụtụtụ bịara ịnara ego ha, ha lere anya na a ga-akwụ ha karịa. Ma a kwụkwara ha niile otu denarị.
MAT 20:11 Mgbe ha naara ego ahụ, ha tamuru ntamu megide nna nwe ụlọ,
MAT 20:12 na-asị, ‘Ndị a bịara nʼikpeazụ rụrụ ọrụ naanị otu awa, ma i meela ka anyị na ha hara. Anyị bụ ndị buru ihe mgbu nke ọrụ ma okpomọkụ nke anwụ niile chara nʼụbọchị taa.’
MAT 20:13 “Ma ọ zara otu nʼime ha sị, ‘Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọbụla. Ọ bụ na mụ na gị ekwughị na m ga-akwụ gị otu denarị nʼụbọchị?
MAT 20:14 Nara nke ruru gị laa. A chọrọ m ịkwụ ndị a bịara nʼikpeazụ ụgwọ dị ka m si kwụọ gị.
MAT 20:15 Ọ bụ na m enweghị ike iji ihe m nwere mee otu ọ masịrị m? Ọ bụ anya ukwu ka ị na-enwe nʼihi afọ ofufu m?’
MAT 20:16 “Ya mere, onye ikpeazụ ga-abụ onye bu ụzọ, ma onye bu ụzọ ga-abụkwa onye ikpeazụ.”
MAT 20:17 Mgbe Jisọs na-aga Jerusalem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ sị ha,
MAT 20:18 “Lee, anyị na-aga Jerusalem ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ,
MAT 20:19 nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ, ndị ga-eji ya mee ihe ọchị, pịa ya ihe, ma kpọgide ya nʼobe. Ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka ọ site nʼọnwụ bilie.”
MAT 20:20 Mgbe ahụ, nne ụmụ Zebedi, duuru ụmụ ya ndị ikom abụọ bịakwute ya, o gburu ikpere nʼala nʼihu ya, rịọ ya ihe ọ chọrọ ka o meere ha.
MAT 20:21 Ọ sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ zara ya sị, “Kwee m nkwa na ụmụ abụọ ndị a ga-anọdụ otu nʼaka nri gị, nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼalaeze gị.”
MAT 20:22 Ma Jisọs zara sị, “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ nke mụ onwe m ga-aṅụ?” Ha zara ya sị, “Ee, anyị nwere ike ịṅụ ya.”
MAT 20:23 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, ma ịnọdụ nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe m, abụghị ihe dịrị m inye, kama ọ dịịrị ndị ahụ Nna m kwadooro ya.”
MAT 20:24 Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu megide ụmụnne abụọ a.
MAT 20:25 Ma Jisọs kpọkọtara ha niile, sị ha, “Nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe,ndịisi ha na-emeso ndị ha na-achị mmeso dị ka o si dị ha mma nʼuche. Ndị ukwu nʼetiti ha na-ejikwa aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha.
MAT 20:26 Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama, onye ọbụla nʼetiti unu chọrọ ịbụ onyeisi, ga-ebu ụzọ bụrụ onye na-ejere unu niile ozi.
MAT 20:27 Ma onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu ga-abụ ohu unu niile.
MAT 20:28 Ọ bụladị dị ka Nwa nke Mmadụ na-abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”
MAT 20:29 Mgbe ha na-ahapụ Jeriko, ọtụtụ igwe mmadụ sooro ya nʼazụ.
MAT 20:30 Ndị ìsì abụọ nọ nʼakụkụ ụzọ ahụ. Mgbe ha nụrụ na ọ bụ Jisọs na-abịa, ha malitere iti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!”
MAT 20:31 Igwe mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ ha. Ma ndịisi ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!”
MAT 20:32 Mgbe Jisọs bịaruru nʼebe ha nọ, o guzoro kpọọ ha, jụọ ha sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”
MAT 20:33 Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ.”
MAT 20:34 Jisọs nwere ọmịiko nʼahụ ha. O metụrụ ha aka nʼanya. Ngwangwa ha bidoro ịhụ ụzọ, ma sorokwa ya.
MAT 21:1 Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji dị nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya.
MAT 21:2 Ọ gwara ha sị, “Baanụ nʼime obodo nta ahụ dị unu nʼihu, ngwangwa unu ga-ahụ otu ịnyịnya ibu elibere nʼosisi nʼebe ahụ, nke ya na nwa ya nọ nʼotu ebe. Tọpụta ha ma kpụtaranụ m ha.
MAT 21:3 Ọ bụrụkwa na onye ọbụla asị unu ihe ọbụla, unu ga-asị ha, ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ha ngwangwa.”
MAT 21:4 E mere nke a ka okwu e kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo.
MAT 21:5 “Gwanụ ada Zayọn sị, ‘lee, eze gị ka ọ na-abịakwute gị. Ọ bụ onye dị nwayọọ. Ọ na-anọkwasịkwa nʼelu ịnyịnya ibu, ee, nʼelu nwa ịnyịnya, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.’ ”
MAT 21:6 Ndị na-eso ụzọ ya gara mee ihe Jisọs sịrị ha mee.
MAT 21:7 Ha kpụtara ịnyịnya ibu ahụ na nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ha ka Jisọs nọkwasị nʼelu ha.
MAT 21:8 Ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ. Ndị ọzọ gbuturu alaka osisi, tụsaa ha nʼụzọ nʼihu ya.
MAT 21:9 Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ nọ nʼihu, na ndị na-esokwa nʼazụ, nọ na-eti mkpu nʼoke olu na-asị: “Hozanna dịrị Nwa Devid!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”
MAT 21:10 Mgbe ọ batara nʼime Jerusalem, ụzụ tụrụ, obodo ahụ niile mere mkpọtụ. Ndị mmadụ bidoro na-ajụ ajụjụ na-asị, “Onye kwa bụ onye a?”
MAT 21:11 Igwe mmadụ ahụ nọ na-asị, “Nwoke a bụ Jisọs, onye amụma ahụ sị Nazaret, obodo dị nʼime Galili.”
MAT 21:12 Jisọs banyere nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem, malite ịchụpụ ndị niile na-ere ahịa na ndị na-azụ ahịa nʼime ụlọnsọ ahụ. O kpuru tebul ndị na-agbanwe ego ihu nʼala, kwatuokwa oche ndị na-ere nduru.
MAT 21:13 Ọ sịrị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ, ‘Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere,’ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike.’”
MAT 21:14 Ndị ìsì na ndị ngwụrọ bịakwutere ya nʼụlọnsọ ahụ. Ọ gwọkwara ha.
MAT 21:15 Ma mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịbama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nʼoke olu nʼogige ụlọnsọ ahụ, na-asị, “Hozanna dịrị Nwa Devid.” Iwe were ha nke ukwuu.
MAT 21:16 Ha sịrị ya, “Ị na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?” Jisọs zara sị ha, “E, ana m anụ ya. Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị, “ ‘I sitere nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara gị, Onyenwe anyị, kwadooro otuto gị’?”
MAT 21:17 Ọ hapụrụ ha, si nʼobodo ahụ pụọ gaa Betani, ebe ọ nọrọ nʼabalị ahụ niile.
MAT 21:18 Nʼụtụtụ, mgbe ọ laghachiri nʼobodo ahụ, agụụ gụrụ ya nke ukwuu.
MAT 21:19 Ọ hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, ọ hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, ọ sịrị ya, “Malite taa gaa nʼihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ.
MAT 21:20 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, o juru ha anya, ha jụọ sị, “Gịnị mere osisi fiig a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?”
MAT 21:21 Jisọs zara sị ha, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe e mere osisi fiig ahụ. Unu pụrụ inye ugwu a iwu sị ya, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa danye nʼoke osimiri.’ Ọ ga-emezukwa.
MAT 21:22 Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, ọ bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya.”
MAT 21:23 Mgbe Jisọs batara nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya ka ọ nọ na-akụzi ihe jụọ ya sị, “Olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Ọ bụ onye nyekwara gị ikike a?”
MAT 21:24 Jisọs zara sị ha, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a niile.
MAT 21:25 Baptizim nke Jọn o sitere nʼeluigwe, ka ọ si nʼaka mmadụ?” Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o si nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Ọ bụ gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’
MAT 21:26 Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o sitere nʼaka mmadụ,’ anyị na-atụ igwe mmadụ ndị a egwu, nʼihi na mmadụ niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma.”
MAT 21:27 Ya mere ha zara Jisọs sị ya: “Anyị amaghị.” Jisọs zakwara ha sị, “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.
MAT 21:28 “Gịnị ka unu chere banyere ihe a? Otu nwoke nwere ụmụ nwoke abụọ gwara nwa ya nke okenye sị ya, ‘Nwa m nwoke, gaa rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m taa.’
MAT 21:29 “Ọ zara ya sị, ‘Agaghị m aga.’ Ma o mesịrị gbanwee obi ya gaakwa rụọ ọrụ ahụ.
MAT 21:30 “Nna ha bịakwutere nwa ya nke nta gwakwa ya otu ihe ahụ. Nwa ahụ zakwara sị, ‘Aga m aga, onyenwe anyị.’ Ma nʼikpeazụ ọ gaghị.
MAT 21:31 “Onye nʼime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?” Ha zara sị ya, “Onye nke mbụ.” Jisọs kọwaara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, ndị ọna ụtụ na ụmụ nwanyị akwụna ga-ebu unu ụzọ banye nʼalaeze Chineke.
MAT 21:32 Nʼihi na Jọn bịakwutere unu igosi unu ụzọ ezi omume, ma unu ekweghị. Ndị ọna ụtụ, na ụmụ nwanyị akwụna chegharịrị. Ọ bụladị mgbe unu hụrụ nke a, o mekwaghị ka unu chegharịa kwere na ya.
MAT 21:33 “Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya.O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ.
MAT 21:34 Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị odibo ya ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nʼubi ahụ.
MAT 21:35 “Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị odibo ya ahụ tie otu onye nʼime ha ihe, gbukwaa onye ọzọ nʼime ha. Ha tụkwara otu nʼime ha nkume.
MAT 21:36 Emesịa, o zigakwara ọtụtụ ndị odibo karịrị ndị nke mbụ nʼọnụọgụgụ. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ.
MAT 21:37 Nʼikpeazụ o zigara ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-asọpụrụ nwa m.’
MAT 21:38 “Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu nʼetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye nketa ihe niile. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ma nwetakwa ihe nketa ya.’
MAT 21:39 Ya mere, ha jidere ya nʼike, kpụrụ ya gafee nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya nʼebe ahụ.
MAT 21:40 “Mgbe onye nwe ubi vaịnị ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?”
MAT 21:41 Ha zara ya sị, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nʼiyi nʼụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi vaịnị ya tinye nʼaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nʼoge ya.”
MAT 21:42 Jisọs sịrị ha, “Ọ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nʼanya anyị.’
MAT 21:43 “Ya mere, ana m eme ka unu ghọta, na a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-amịpụta ezi mkpụrụ.
MAT 21:44 Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume a ga-etiwasị, ma ọ ga-egwepịa onye ọbụla nke ọ dakwasịrị.”
MAT 21:45 Mgbe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nụrụ ilu ya ndị a, ha ghọtara na ọ na-ekwu banyere ha.
MAT 21:46 Ha chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya, ma oke egwu igwe mmadụ ahụ tụrụ ha, nʼihi na ha gụrụ ya nʼonye amụma.
MAT 22:1 Jisọs gwara ha okwu ọzọ nʼilu sị,
MAT 22:2 “Alaeze eluigwe dị ka otu eze, nke kwadoro oke oriri ọlụlụ di na nwunye, nʼihi nwa ya nwoke.
MAT 22:3 O zipụrụ ndị ohu ya ka ha gaa chetara ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa. Ma ha niile achọghị ịbịa.
MAT 22:4 “O zipụkwara ndị ohu ya ọzọ na-ejere ya ozi ka ha gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ oriri sị, ‘E dozichaala ihe oriri ugbu a, egburu m oke ehi, na anụ ọzọ gbara abụba. Edoziela ihe niile. Bịanụ nʼoriri ọlụlụ di na nwunye.’
MAT 22:5 “Ma ndị ahụ niile a kpọrọ oriri gawaara mkpa ha nʼihi na ha akpọghị ya ihe ọbụla. Otu onye gara nʼala ubi ya, nke ọzọ nʼụlọ ahịa ya.
MAT 22:6 Ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere ma gbukwaa ha.
MAT 22:7 Onye eze ahụ were iwe nke ukwuu, zipụ ndị agha ya ka ha gaa laa ndị ogbu mmadụ ahụ nʼiyi, rechapụkwa obodo ha nʼọkụ.
MAT 22:8 “Mgbe ahụ ọ gwara ndị ohu ya sị, ‘E doziela m oriri ọlụlụ di na nwunye, ma ndị a kpọrọ oku ekwesighị ekwesi.
MAT 22:9 Ugbu a, gaanụ nʼakụkụ ụzọ niile, kpọbatanụ ndị niile unu hụrụ, ka ha bịa nʼoriri ọlụlụ di na nwunye a.’
MAT 22:10 Ndị ohu ahụ pụrụ gaa nʼokporoụzọ niile kpọbata mmadụ niile ha hụrụ. Ha kpọbatara ndị bụ ezi mmadụ na ndị bụ ajọ mmadụ. Ụlọ oriri ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ.
MAT 22:11 “Ma mgbe eze ahụ batara ileta ndị niile nọ na nri, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye.
MAT 22:12 Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, ‘Enyi m, i si aṅaa bata nʼebe a mgbe ị na-eyighị uwe ọlụlụ di na nwunye?’ O mechiri ọnụ ya nʼihi na o nweghị ihe ọ ga-asa.
MAT 22:13 “Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ ya eriri, aka na ụkwụ, tụpụkwanụ ya nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’
MAT 22:14 “Nʼihi na akpọrọ ọtụtụ mmadụ oku, maọbụ mmadụ ole na ole ka a họọrọ.”
MAT 22:15 Mgbe ahụ ndị Farisii zukọtara na-achọ ụzọ ha ga-esi mee ka o kwuhie ọnụ ka ha site na ya jide ya.
MAT 22:16 Ha zigara ndị na-eso ụzọ ha na ndị nʼotu Herọd ka ha jụọ ya sị, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu, na ị na-ezikwa ụzọ Chineke nʼeziokwu. Ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ.
MAT 22:17 Ugbu a gwa anyị, gịnị bụ uche gị? O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?”
MAT 22:18 Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nʼobi, ọ zara sị ha, “Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa?
MAT 22:19 Gosinụ m ego e ji akwụ ụgwọ ụtụ.” Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego.
MAT 22:20 Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye ka e sekwasịrị onyinyo ya nʼelu ego a? Aha onye kwa dị nʼokpuru onyinyo a?”
MAT 22:21 Ha zara sị ya, “Ọ bụ nke Siza.” Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma. Nyenụ Siza ihe ruuru Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe niile bụ nke ruuru Chineke.”
MAT 22:22 Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbagwojuru ha anya, nʼihi ya, ha hapụrụ ya pụọ.
MAT 22:23 Nʼụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya ịghụ ya ọnụ.
MAT 22:24 Onye ozizi, “Mosis kwuru sị, ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ka ọ mụtara nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwa.
MAT 22:25 Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa nʼetiti anyị. Onye nke mbụ lụrụ nwunye, nwụọ, ma ebe ọ dịghị ụmụ ọ mụtara, ọ hapụrụ nwanne ya nwunye ya.
MAT 22:26 Otu a ka nke abụọ mekwara, ma nke atọ, ruo na nke asaa.
MAT 22:27 Nʼikpeazụ, nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara.
MAT 22:28 Ugbu a, nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a lụtụchara ya mgbe ọ nọ nʼụwa?”
MAT 22:29 Jisọs zara ha sị, “Unu na-ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu. Unu aghọtakwaghị ụdị ike Chineke nwere.
MAT 22:30 Nʼihi na mbilite nʼọnwụ, ịlụ di na nwunye agaghị adịkwa, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe.
MAT 22:31 Ma nʼihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụ na unu agụtabeghị ihe Chineke gwara unu sị,
MAT 22:32 Mụ onwe m bụ Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ.”
MAT 22:33 Mgbe igwe mmadụ ahụ nụrụ nke a, ozizi ya juru ha anya.
MAT 22:34 Ma mgbe ndị Farisii nụrụ na ọ emeela ka ndị Sadusii mechie ọnụ ha, ha gbakọtara otu ebe.
MAT 22:35 Otu onye nʼime ha, bụ onye ozizi iwu bịara jụọ ya ajụjụ iji nwaa ya:
MAT 22:36 “Onye ozizi, olee iwu nke kachasị mkpa nʼime iwu niile?”
MAT 22:37 Ọ zara sị ya, “ ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nʼanya site nʼobi gị niile na site na mkpụrụobi gị niile, na site nʼuche gị niile.’
MAT 22:38 Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu niile.
MAT 22:39 Iwu ọzọ na-eso nke a nʼịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka i si hụ onwe gị nʼanya.’
MAT 22:40 Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma kwuru dabeere nʼebe iwu abụọ ndị a nọ.”
MAT 22:41 Mgbe ndị Farisii gbakọrọ nʼotu ebe, Jisọs jụrụ ha,
MAT 22:42 “Gịnị ka unu na-eche banyere Kraịst? Nwa onye ka ọ bụ?” Ha zara sị ya, “Ọ bụ nwa Devid.”
MAT 22:43 Ọ sịrị ha, “Gịnị mekwaranụ Devid site na ntụziaka nke Mmụọ Nsọ jiri kpọọ ya ‘Onyenwe m’? Nʼihi na ọ sịrị,
MAT 22:44 “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị ya, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’
MAT 22:45 Ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị,’ oleekwanụ otu o si bụrụkwa nwa ya?”
MAT 22:46 Ọ dịghị onye pụrụ ịsa ya okwu. Sitekwa nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị onye ọbụla nwere anya ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.
MAT 23:1 Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ niile na ndị na-eso ụzọ ya sị,
MAT 23:2 “Ndị ozizi iwu na ndị Farisii na-anọ nʼoche Mosis.
MAT 23:3 Ya mere, meenụ ma na-edebekwanụ ihe niile ha na-agwa unu. Ma unu esokwala omume ha. Nʼihi na ha adịghị eme ihe ha na-ekwusa. Ha na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ.
MAT 23:4 Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu bokwasị ndị ọzọ nʼubu, ma ha onwe ha agaghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka i buli ha.
MAT 23:5 “Ihe niile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ hụ ha. Ha na-eme ka igbe ntae tinyere iwu ndị dị mkpa e depụtara nke ha na-ekekwasị nʼegedege ihu na nʼaka dị obosara na-emekwa ka ọnụnụ uwe ha buo ibu.
MAT 23:6 Ha hụrụ ịnọ nʼisi oche nʼoge mmemme oriri ọbụla na ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nʼanya.
MAT 23:7 Ọ na-amasị ha mgbe a na-ekele ha ekele pụrụ iche nʼọma ahịa, ndị ọzọ a na-akpọkwa ha, ‘Onye ozizi.’
MAT 23:8 “Unu ekwela ka onye ọbụla kpọọ unu ‘Onye ozizi,’ nʼihi na unu nwere naanị otu Onye ozizi. Unu niile bụkwa ụmụnne. Ọ dịghị onye ka ibe ya ukwuu.
MAT 23:9 Unu akpọkwala onye ọbụla nʼụwa a ‘Nna,’ nʼihi na unu nwere otu Nna nke bi nʼeluigwe.
MAT 23:10 Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nʼihi na ọ bụ naanị otu onyendu ka unu nwere, ya bụ Kraịst.
MAT 23:11 Onye dị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.
MAT 23:12 Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala. Ma onye ọbụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.”
MAT 23:13 “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi bata nʼalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata. Unu adịghịkwa enye ndị ọzọ ohere ịbata.
MAT 23:14 “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-eripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ, ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ogologo ekpere ka mmadụ hụ unu. Unu ga-anata ikpe ọmụma dị ukwuu.
MAT 23:15 “Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-agafe oke osimiri na mba dị iche iche, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee ya okpukpu abụọ ka ọ bụrụ nwa ọkụ ala mmụọ karịa onwe unu.
MAT 23:16 “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ndu kpuru ìsì! Nʼihi na unu na-asị, Onye ọbụla jiri ụlọnsọ ṅụọ iyi, iyi ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla jiri ọlaedo dị nʼime ụlọnsọ ṅụọ iyi kwesiri imezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.
MAT 23:17 Ndị nzuzu kpuru ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ ọlaedo ahụ, ka ọ bụ ụlọnsọ nke doro ọlaedo ahụ nsọ?
MAT 23:18 Unu na-ezikwa ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, iyi ahụ ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla ga-eji onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ṅụọ iyi ga-emezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.’
MAT 23:19 Leenụ ka unu si bụrụ ndị ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ bụ ebe ịchụ aja na-edo onyinye ahụ nsọ?
MAT 23:20 Ya mere, mgbe onye ọbụla ji ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, ọ bụ ebe ịchụ aja ahụ na onyinye dị nʼelu ya ka o ji ṅụọ iyi ahụ.
MAT 23:21 Otu a kwa, onye ji ụlọnsọ ahụ ṅụọ iyi jikwa ụlọnsọ ahụ na onye bi nʼime ya na-aṅụ iyi.
MAT 23:22 Mgbe mmadụ jikwa eluigwe ṅụọ iyi, ọ bụ ocheeze Chineke na onye nọdụrụ nʼelu ocheeze ahụ ka o ji ṅụọ iyi.
MAT 23:23 “E, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu ruo nʼakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nʼubi unu, dịka mint, diil na kumin, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na okwukwe ihe dị mkpa. Ihe ndị a ka unu kwesiri ibu ụzọ mee ma gharakwa ileghara iwu ndị ọzọ anya.
MAT 23:24 Ndị ndu kpuru ìsì! Unu na-azapụ ijiji site na mmanya unu na-aṅụ, ma unu na-eloda ịnyịnya kamel.
MAT 23:25 “Ahụhụ ga-adakwasị unu, ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-elezi anya nke ọma mee ka azụ iko mmiri unu, na azụ efere unu dị ọcha, ma ime ha jupụtara na ịpụnarị mmadụ ihe nʼike na ọchịchọ ọjọọ niile.
MAT 23:26 Gị onye Farisii kpuru ìsì! Buru ụzọ mee ka ime iko dị ọcha, mgbe ahụ azụ ya ga-adịkwa ọcha.
MAT 23:27 “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ya dị ka ihe mara mma, ma ime ya jupụtara nʼọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe niile na-adịghị ọcha.
MAT 23:28 Nʼụzọ dị otu a, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume, ma nʼime unu, unu jupụtara nʼihu abụọ na ndị ajọ omume.
MAT 23:29 “E, ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma na-ewerekwa ihe ịchọ mma na-edozi nkume ncheta ndị ezi omume.
MAT 23:30 Unu na-asịkwa, ọ bụrụ na anyị nọ nʼoge nna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wufuo ọbara ndị amụma.
MAT 23:31 Site nʼụzọ dị otu a, unu na-agba akaebe megide onwe unu na unu bụ ụmụ ndị gburu ndị amụma.
MAT 23:32 Gaanụ sorokwa nzọ ụkwụ nna unu ha, ka unu rụzuo ọrụ ahụ ha malitere.
MAT 23:33 “Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe nke ịba nʼọkụ ala mmụọ?
MAT 23:34 Ya mere, aga m ezitere unu ndị amụma, ndị amamihe na ndị nkuzi. Ụfọdụ nʼime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nʼobe, ndị ọzọkwa ka unu ga-apịa ihe nʼụlọ nzukọ unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nʼotu obodo gaa nʼobodo ọzọ.
MAT 23:35 Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nʼihi ọbara nke ndị ezi omume niile e gburu nʼụwa, site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya nwa Berekaya, onye unu gburu nʼetiti ụlọnsọ nʼebe ịchụ aja unu.
MAT 23:36 Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile, ga-abịakwasị ọgbọ a.
MAT 23:37 “O Jerusalem, Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma, na nke na-atụ ndị niile e ziteere gị nkume. Ugboro ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ si achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya ichebe ha? Ma ị chọghị ka m mee otu a!
MAT 23:38 Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
MAT 23:39 Nʼihi na asị m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ tutu ruo mgbe unu ga-asị, Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. ”
MAT 24:1 Mgbe Jisọs si nʼụlọnsọ ahụ na-apụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya na-achọ igosi ya akụkụ dị iche iche nke ụlọnsọ ukwu ahụ.
MAT 24:2 Ma ọ zara ha sị, “Unu hụrụ ihe ndị a niile? Nʼezie agwa m unu, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nʼelu ibe ya, nke a na-agaghị akwatu nʼala.”
MAT 24:3 Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya iche, sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama nke oge i ji alọghachi na nke ọgwụgwụ ụwa a?”
MAT 24:4 Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu ụzọ.
MAT 24:5 Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m, na-ekwu sị, ‘Abụ m Kraịst ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ.
MAT 24:6 Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nʼihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha anaghị egosi na ọgwụgwụ oge eruola.
MAT 24:7 Mba ga-ebili megide mba ibe ya, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; oke ụnwụ,na ala ọma jijiji ga-adịkwa nʼọtụtụ ebe dị iche iche.
MAT 24:8 Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa.
MAT 24:9 “Mgbe ahụ ha ga-arara unu nyefee nʼaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbukwa unu. Mba niile ga-akpọ unu asị nʼihi m.
MAT 24:10 Ọtụtụ ga-ada site nʼokwukwe ha nʼoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha ma nʼọnya, kpọọkwa ibe ha asị.
MAT 24:11 Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ.
MAT 24:12 Nʼihi na ajọ omume bara ụba nʼebe niile, ịhụnanya ọtụtụ ndị mmadụ nʼebe ibe ha nọ ga-ajụ oyi.
MAT 24:13 Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
MAT 24:14 A ga-ekwusa oziọma nke alaeze ahụ nye ụwa niile ka ọ bụrụ ihe ama nye mba niile. Emesịa ọgwụgwụ oge ahụ ga-abịa.
MAT 24:15 “Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi, nke e kwuru okwu ya site nʼọnụ Daniel onye amụma,ka ọ na-eguzo nʼebe nsọ (onye na-agụ ya nwee nghọta ihe ọ pụtara).
MAT 24:16 Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu.
MAT 24:17 Ka onye nọ nʼelu ụlọ ghara ịrịdata ka ọ banye nʼime ụlọ ya, ịkwapụta ngwongwo dị nʼime ụlọ ya.
MAT 24:18 Ka onye nọ nʼubi ghara ịlọghachi nʼụlọ ya ịchịrị uwe ya.
MAT 24:19 Ma ịta ahụhụ ga-adịrị ndị nwanyị di ime, na ndị na-enye ụmụaka ara nʼụbọchị ahụ
MAT 24:20 Kpesienụ ekpere ike ka unu ghara ịgba ọsọ a nʼoge oke oyi, maọbụ nʼụbọchị izuike.
MAT 24:21 Nʼihi na oke mkpagbu ga-adị, ụdị nke ụwa na-ahụbeghị mbụ, na nke anya na-agaghị ahụkwa ọzọ site na mmalite ụwa ruo mgbe ahụ.
MAT 24:22 “Ọ bụrụ na-emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, o nweghị onye a ga-azọpụta, ma nʼihi ndị ya ọ họpụtara, ụbọchị ndị ahụ ga-adị mkpụmkpụ.
MAT 24:23 Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee ya nʼebe ahụ,’ unu ekwela.
MAT 24:24 Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe oke ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha ga-esite nʼọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ a họpụtara.
MAT 24:25 Lee, agwala m unu ihe ndị a, mgbe ha na-emebeghị.
MAT 24:26 “Ya mere, ọ bụrụ na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ọzara,’ unu agakwala. Ọ bụrụkwa na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ime ụlọ,’ unu ekwela.
MAT 24:27 Nʼihi na ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka amụma na-egbu nʼọwụwa anyanwụ nke a na-ahụ anya nʼọdịda anyanwụ.
MAT 24:28 Matakwanụ na ebe ọbụla ozu dị, nʼebe ahụ ka udele na-ezukọta.
MAT 24:29 “Ngwangwa mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ niile gabigasịrị, “ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ìhè, kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa, ike niile nke eluigwe ga-ama jijiji.’
MAT 24:30 “Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube.
MAT 24:31 Ọ ga-ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị niile a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke eluigwe na ụwa.
MAT 24:32 “Ugbu a mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya malitere iwepụta ome dị nro, na-epupụtakwa akwụkwọ ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso.
MAT 24:33 Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile ka ha na-eme marakwanụ na ọ nọ nso, ọ bụladị nʼọnụ ụzọ unu.
MAT 24:34 Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile aghaghị imezu tupu ọgbọ a agabiga.
MAT 24:35 Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.
MAT 24:36 “Ma o nweghị onye ọbụla maara ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ ga-abụ. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi nọ nʼeluigwe amaghị ya. Ọkpara ahụ amakwaghị. Ọ bụ naanị Nna maara ya.
MAT 24:37 Ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka ọ dị nʼụbọchị Noa.
MAT 24:38 Nʼoge ahụ tupu iju mmiri ahụ abịa, ndị mmadụ nọ na-eri na aṅụ, na-emekwa mmemme ọlụlụ di na nwunye, ruo ụbọchị Noa banyere nʼime ụgbọ mmiri ya.
MAT 24:39 Ha amataghị ihe ga-eme tutu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha niile. Otu ahụ ka ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị.
MAT 24:40 Mmadụ abụọ ga na-arụkọ ọrụ nʼubi ha, a ga-ewepụ otu hapụkwa onye nke ọzọ.
MAT 24:41 Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ nri na nkume igwe nri, a ga-ewere otu, ma hapụkwa nke ọzọ.
MAT 24:42 “Nʼihi nke a, na-echenụ nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.
MAT 24:43 Ma ghọtanụ nke a: Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ mara oge onye ohi ga-abịa nʼụlọ ya nʼabalị, ọ ga-anọ na nche nʼoge ahụ. Ọ gaghị ekwe ka onye ohi kụwaa ụlọ ya.
MAT 24:44 Otu a ka unu onwe unu pụrụ isi nọgide na nche oge niile, nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.
MAT 24:45 “Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ndị ohu nọ nʼezinaụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri nʼoge ya?
MAT 24:46 Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a.
MAT 24:47 Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere.
MAT 24:48 Ma ọ bụrụ na ohu ahụ bụ onye ajọọ omume na-asị onwe ya,‘Nna m ukwu anọọla ogologo oge,’
MAT 24:49 ọ bụrụkwa na o bido iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị ọṅụ oke mmanya na-eri, na-aṅụ.
MAT 24:50 Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị.
MAT 24:51 Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ebe ndị ihu abụọ nọ. Ebe e nwere ịkwa akwa na ịta ikikere eze.
MAT 25:1 “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ.
MAT 25:2 Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu.
MAT 25:3 Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ.
MAT 25:4 Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha.
MAT 25:5 Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra.
MAT 25:6 “Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’
MAT 25:7 “Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụbiliri mụnye oriọna ha.
MAT 25:8 Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’
MAT 25:9 “Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’
MAT 25:10 “Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.
MAT 25:11 “Emesịa, ise ndị nzuzu ahụlọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’
MAT 25:12 “Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’
MAT 25:13 “Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ.
MAT 25:14 “Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka.
MAT 25:15 O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti.O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ ọ hapụrụ ha gaa ije ya.
MAT 25:16 Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru.
MAT 25:17 Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru.
MAT 25:18 Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma.
MAT 25:19 “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya.
MAT 25:20 Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’
MAT 25:21 “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’
MAT 25:22 “Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’
MAT 25:23 “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’
MAT 25:24 “Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị.
MAT 25:25 Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’
MAT 25:26 “Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị.
MAT 25:27 Ị gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri.
MAT 25:28 “ ‘Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri.
MAT 25:29 Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ ọ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya ọ bụladị nke nta o nwere.
MAT 25:30 Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’
MAT 25:31 “Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya.
MAT 25:32 Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu.
MAT 25:33 Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya.
MAT 25:34 “Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa.
MAT 25:35 Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m.
MAT 25:36 Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’
MAT 25:37 “Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-ajụ ya sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị?
MAT 25:38 Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị gba ọtọ anyị enye gị uwe?
MAT 25:39 Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’
MAT 25:40 “Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, ‘Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.’
MAT 25:41 “Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.
MAT 25:42 Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ.
MAT 25:43 Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’
MAT 25:44 “Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’
MAT 25:45 “Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’
MAT 25:46 “Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”
MAT 26:1 Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị,
MAT 26:2 “Dị ka unu maara nke ọma, Mmemme Ngabiga ga-amalite mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼoge ahụ, a ga-ararakwa Nwa nke Mmadụ nye ka a kpọgide ya nʼobe.”
MAT 26:3 Nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị okenye zukọtara nʼụlọeze otu onyeisi nchụaja a na-akpọ Kaịfas.
MAT 26:4 Ha gbara izu ịchọpụta ụzọ ha ga-esi jide Jisọs na nzuzo gbuo ya.
MAT 26:5 Ha kwekọrịta sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme ka ọgbaaghara hapụ ịdị nʼetiti ndị mmadụ.”
MAT 26:6 Mgbe Jisọs nọ na Betani, nʼụlọ Saimọn onye ekpenta,
MAT 26:7 otu nwanyị bu karama alabasta nke mmanụ otite isi ụtọ dị oke ọnụahịa dị nʼime ya, bịakwutere ya, nke ọ wụsara ya nʼisi dị ka ọ na-anọdụ ala nʼeri nri.
MAT 26:8 Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. Ha sịrị, “Olee ụdị ịla nʼiyi dị nke a!
MAT 26:9 A gaara erepụta mmanụ a ego dị ukwuu were ego e retara ya nyere ndị ogbenye aka.”
MAT 26:10 Ebe Jisọs matara ihe ha na-atamu nʼobi ha, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji esogbu nwanyị a? O merela m ihe dị mma.
MAT 26:11 Unu na ndị ogbenye ga-anọ oge niile, ma ọ bụghị mụ na unu ga-anọ mgbe niile.
MAT 26:12 Nʼihi na site nʼịwụ m mmanụ otite a nʼahụ, o doziela m maka olili.
MAT 26:13 Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla ezisara oziọma a nʼụwa niile, a ga na-echeta nwanyị a nʼihi ihe ọma a o meere m.”
MAT 26:14 Mgbe ahụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt, jekwuuru ndịisi nchụaja.
MAT 26:15 Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu ga-enye m ma m rara ya nye nʼaka unu?” Ha kwụrụ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ.
MAT 26:16 Site nʼoge ahụ na-aga, ọ chọrọ ohere ịrara ya nye nʼaka ha.
MAT 26:17 Nʼụbọchị mbụ nke mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe gị maka oriri Ngabiga?”
MAT 26:18 Ọ zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nʼime obodo sị ya, Onye ozizi sị, ‘Oge m abịala nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri Ngabiga nʼụlọ gị.’ ”
MAT 26:19 Ndị na-eso ụzọ ya mere dị ka Jisọs gwara ha, doziekwa oriri Ngabiga ahụ nʼebe ahụ.
MAT 26:20 Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ.
MAT 26:21 Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị, “Nʼezie ana m agwa unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.”
MAT 26:22 Ha nwere oke mwute, ma malite ịjụ ya nʼotu nʼotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m?”
MAT 26:23 Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-amanyekọta aka nʼotu efere ga-arara m nye.
MAT 26:24 Lee Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e si buo ya nʼamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”
MAT 26:25 Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Ọ zara sị, “Gị onwe gị ekwuola ya.”
MAT 26:26 Mgbe ha nọkwa na-eri nri, Jisọs were ogbe achịcha ahụ, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ nke a rie, nʼihi na nke a bụ anụ ahụ m.”
MAT 26:27 Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu niile ṅụọnụ site nʼiko a.
MAT 26:28 Nʼihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya maka ọtụtụ mgbaghara mmehie.
MAT 26:29 Ana m agwa unu, na-agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, tutu ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nʼụzọ dị iche nʼalaeze Nna m.”
MAT 26:30 Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
MAT 26:31 Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nʼabalị taa, unu niile ga-agbahapụ naanị m. Nʼihi na e dere ya, sị: “ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, atụrụ nke igwe atụrụ ahụ ga-agbasasịkwa.’
MAT 26:32 Ma mgbe e mere ka m si nʼọnwụ bilite, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.”
MAT 26:33 Pita sịrị, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị gbalaga, agaghị m ahapụ gị.”
MAT 26:34 Jisọs sịrị, “Nʼezie agwa m gị, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
MAT 26:35 Ma Pita kwuru sị, “Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka m soro gị nwụọ, agaghị m agọnarị gị.” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ndị ahụ niile na-eso ụzọ ya kwuru.
MAT 26:36 Mgbe Jisọs bịara nʼogige ahụ a na-akpọ Getsameni, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa nʼihu nke nta kpee ekpere.”
MAT 26:37 Ọ kpọọrọ Pita tinyere onwe ya, na ụmụ Zebedi abụọ. Ọ malitere inwe obi mwute nʼime onwe ya. Obi malitekwara ịlọ ya mmiri.
MAT 26:38 Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọgidenụ nʼebe a soro m na-eche nche.”
MAT 26:39 Ọ gara nʼihu nke nta daa, kpuo ihu ya nʼala, kpee ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.”
MAT 26:40 Ya mere, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Ọ bụ na unu enweghị ike i soro m chee nche, ọ bụladị otu awa?
MAT 26:41 Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa.Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.”
MAT 26:42 Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị.”
MAT 26:43 Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ.
MAT 26:44 Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ.
MAT 26:45 Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Lee, oge awa ahụ abịala, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie.
MAT 26:46 Bilienụ ka anyị gawa. Lee, onye ahụ na-arara m nye na-abịa!”
MAT 26:47 Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na ọtụtụ igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zitere ha.
MAT 26:48 Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!”
MAT 26:49 Ngwangwa o jekwuuru Jisọs sị ya, “Ekele, Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ.
MAT 26:50 Jisọs gwara ya sị, “Enyi m, mee ihe ị bịara ime ngwangwa.” Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ bịara nso jide Jisọs, sekpụrụ ya nʼike.
MAT 26:51 Otu onye nʼime ndị ha na Jisọs nọ, setịrị aka ya, mịpụta mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya.
MAT 26:52 Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya, nʼihi na mmadụ ọbụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya ga-anwụ site na mma.
MAT 26:53 I cheghị na m pụrụ ịrịọ Nna m ka o zitere m ihe karịrị usuu ndị mmụọ ozi iri na abụọ nʼotu ntabi anya?
MAT 26:54 Ma olee otu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-esi mezuo, nke kwuru na ọ ghaghị ịdị otu a?”
MAT 26:55 Nʼoge awa ahụ, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ sị, “Unu pụtara chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi? Anọrọla m ziekwa ihe nʼụlọnsọ kwa ụbọchị, ma unu ejideghị m.
MAT 26:56 Ma ihe ndị a na-eme ka ihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo.” Nʼoge ihe ndị a niile na-eme, ndị na-eso ụzọ ya niile hapụrụ ya gbalaga.
MAT 26:57 Ndị jidere Jisọs duuru ya gaa nʼụlọ Kaịfas, onyeisi nchụaja. Ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu zukọtara nʼebe ahụ.
MAT 26:58 Pita sogidere Jisọs nʼazụ site nʼebe dị anya. O rutere nʼobi onyeisi nchụaja, baa nʼime ụlọ, sorokwa ndị na-eje ozi nọdụ ala, ka o nwe ike ịhụ otu ihe a ga-esi bie.
MAT 26:59 Ndịisi nchụaja, na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ahụ nọ na-achọ ama ụgha megide Jisọs, ka ha hụ ụzọ ha ga-esi gbuo ya.
MAT 26:60 Ma ọ dịghị nke ha chọtara, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara. Nʼikpeazụ, mmadụ abụọ pụtara
MAT 26:61 kwuo sị, “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọnsọ ukwu nke Chineke, wughachikwa ya nʼụbọchị atọ. ’ ”
MAT 26:62 Onyeisi nchụaja biliri ọtọ kwuo sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị bụ ama ndị a a na-agba megide gị?”
MAT 26:63 Ma Jisọs ekwughị ihe ọbụla. Onyeisi nchụaja gwara ya sị, Eji m aha Chineke dị ndụ nye gị iwu, sị gị, “gwa anyị, ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke?”
MAT 26:64 Jisọs gwara ya sị, “Gị onwe gị kwuru ya. Ma ana m agwa unu, site ugbu a na-aga nʼihu, unu ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ nʼaka nri nke Onye dị ike, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”
MAT 26:65 Mgbe ahụ onyeisi nchụaja dọwara uwe ya, kwuo sị, “O kwuola arụ! Olee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Unu nụkwara nkwulu ya?
MAT 26:66 Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha zara sị ya, “O kwesiri ka ọ nwụọ!”
MAT 26:67 Mgbe ahụ, ha gbụsara ya ọnụ mmiri asọ nʼihu, tiekwa ya aka. Ndị ọzọ maara ya ụra,
MAT 26:68 sị ya, “Buoro anyị amụma, gị, Kraịst. Onye tiri gị ihe?”
MAT 26:69 Mgbe ahụ Pita nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nʼime ụmụ agbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Ị bụkwanụ otu nʼime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.”
MAT 26:70 Ma ọ gọrọ nʼihu ha niile sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.”
MAT 26:71 Mgbe ọ pụrụ gaa nọdụ nʼọnụ ụzọ mbata, nwaagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nọ nʼebe ahụ sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret nọkọrọ.”
MAT 26:72 Ọzọkwa, o weere ịṅụ iyi gọọ, “Amaghị m onye nwoke ahụ bụ.”
MAT 26:73 Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo nʼebe ahụ bịakwutere Pita sị ya, “Nʼezie, ịbụ otu nʼime ha, nʼihi na asụsụ gị agbaala gị ama.”
MAT 26:74 Ọ malitere ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi sị, “Amaghị m nwoke a.” Mgbe ahụkwa oke ọkpa kwara akwa.
MAT 26:75 Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru sị, “Tupu oke ọkpa akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” O si nʼebe ahụ pụọ, gaa kwaa akwa nke ukwuu.
MAT 27:1 Mgbe chi bọrọ, ndịisi nchụaja niile na ndị okenye gbara izu megide Jisọs otu ha ga-esi gbuo ya.
MAT 27:2 Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya pụọ, nyefee ya nʼaka Pailet onye bụ gọvanọ.
MAT 27:3 Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ.
MAT 27:4 Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.” Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.”
MAT 27:5 Ọ wụsara ego ọlaọcha ahụ nʼala ụlọnsọ, pụọ gaa kwụọ ụdọ.
MAT 27:6 Ndịisi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nʼime ụlọakụ, nʼihi na ọ bụ ego ọbara.”
MAT 27:7 Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara ma were ego ahụ zụta ala nʼaka otu ọkpụ ite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa.
MAT 27:8 Nke a mere e ji na-akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara,” ruo taa.
MAT 27:9 Nʼụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, bụ ọnụahịa onye ahụ, nke ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel kpebiri na a ga-akwụ nʼisi ya.
MAT 27:10 Ha ji ego ahụ zụọ ubi onye ọkpụ ite, dị ka Onyenwe anyị nyere m iwu.”
MAT 27:11 Nʼoge a Jisọs guzo nʼihu gọvanọ. Gọvanọ jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
MAT 27:12 Mgbe ndịisi nchụaja na ndị okenye boro ya ebubo ụgha, o kwughị ihe ọbụla.
MAT 27:13 Ya mere, Pailet sịrị ya, “Ị naghị anụ ihe ndị a niile ha na-ebo gị?”
MAT 27:14 Ma ọ zaghị ọ bụladị otu mkpụrụ okwu nʼebubo ndị ahụ. Ihe a gbagwojuru gọvanọ anya nke ukwuu.
MAT 27:15 Ugbu a, ọ bụ omenaala gọvanọ nʼoge mmemme na ọ ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye igwe mmadụ họọrọ.
MAT 27:16 Ma nʼoge a e nwere otu onye mkpọrọ nke ọtụtụ mmadụ maara nke ọma. A na-akpọ Jisọs Barabas.
MAT 27:17 Mgbe igwe mmadụ niile zukọrọ, Pailet sịrị ha, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ bụ Jisọs Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?”
MAT 27:18 Nʼihi na ọ maara nke ọma na ọ bụ site nʼekworo ka ha ji rara Jisọs nye nʼaka ya.
MAT 27:19 Mgbe ọ nọkwasịrị nʼelu oche ikpe ya, nwunye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nʼihe gbasara nwoke onye ezi omume ahụ. Nʼihi na ahụjuru m anya na nrọ nʼabalị gara aga nʼihi ya.”
MAT 27:20 Ma ndịisi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọ ya, ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya.
MAT 27:21 Ọzọkwa, gọvanọ sịrị ha, “Nʼime mmadụ abụọ ndị a onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha sịrị, “Barabas!”
MAT 27:22 Pailet sịrị ha, “Gịnị ka m ga-eme Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” Ha niile sịrị, “Kpọgide ya nʼobe!”
MAT 27:23 Ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!”
MAT 27:24 Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọ pụrụ ime, kama na ụzụ na ọgbaaghara na-amalite. O weere mmiri kwọọ aka ya nʼihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nʼebe ọbara nwoke a dị. Jirinụ aka unu hụ maka ya.”
MAT 27:25 Igwe mmadụ ahụ zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Ka ọbara ya dị nʼisi anyị na nʼisi ụmụ anyị!”
MAT 27:26 Mgbe ahụ ọ hapụụrụ ha Barabas. Mgbe ọ pịachara Jisọs ihe, ọ raara ya nye ka ha kpọgide ya nʼobe.
MAT 27:27 Mgbe ahụ ndị agha gọvanọ duuru Jisọs baa nʼogige ụlọ ndị agha, mee ka otu ndị agha niile gbaa ya gburugburu.
MAT 27:28 Ha yipụrụ ya uwe ya, yinye ya uwe mwụda na-acha uhie uhie.
MAT 27:29 Ha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi. Ha tinyekwara ya mkpara achara nʼaka nri, gbuo ikpere nʼala nʼihu ya, na-akwa ya emo na-asị, “Ekele, Eze ndị Juu!”
MAT 27:30 Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri asọ, werekwa osisi ahụ kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe.
MAT 27:31 Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya, duuru ya pụọ, ịga kpọgide ya nʼobe.
MAT 27:32 Mgbe ha na-apụ, ha zutere otu nwoke onye obodo Sirini a na-akpọ Saimọn. Ha manyere ya ka o buru obe ya.
MAT 27:33 Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara, “ebe okpokoro isi”).
MAT 27:34 Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ.
MAT 27:35 Mgbe ha kpọgidechara ya nʼelu obe. Ha fere nza nke ha jiri kee uwe ya nʼetiti onwe ha.
MAT 27:36 Ha nọdụkwara ala nʼebe ahụ na-eche ya nche.
MAT 27:37 Nʼelu ebe isi ya dị, ka ha debere ihe ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere: Onye a bụ Jisọs, Eze ndị Juu.
MAT 27:38 Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe. Otu onye nʼaka nri, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
MAT 27:39 Ndị na-agafe nʼụzọ na-ekwutọ ya, na-efufekwa isi ha,
MAT 27:40 na-asịkwa, “Leenụ onye nwere ike ịkwatu ụlọnsọ Chineke wughachi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ! Zọpụtanụ onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke si nʼelu obe ahụ rịdata!”
MAT 27:41 Ndịisi nchụaja, ndị ozizi iwu na ndị okenye sokwa na-eme ya ihe ọchị, na-asị,
MAT 27:42 “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ọ bụ eze ndị Izrel; ya si nʼelu obe rịdata ugbu a, anyị ga-ekwerekwa na ya.
MAT 27:43 Ọ tụkwasịrị Chineke obi, ọ bụrụ na ọ masịrị Chineke, ya napụta ya ugbua, nʼihi na o kwuru sị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke. ’ ”
MAT 27:44 Ọ bụladị ndị ohi ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.
MAT 27:45 Ma site nʼelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nʼelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile.
MAT 27:46 Nʼoge dị ka elekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani?” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”).
MAT 27:47 Mgbe ụfọdụ ndị guzo nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Ọ na-akpọ Ịlaịja.”
MAT 27:48 Nʼotu oge ahụ kwa otu onye nʼime ha gbaara ọsọ were ogbo denye ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nʼosisi, welie ya elu, chee ya ka ọ ṅụọ.
MAT 27:49 Ma ndị ọzọ sịrị, “Hapụnụ, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa ịzọpụta ya.”
MAT 27:50 Ọzọkwa, Jisọs jiri oke olu tie mkpu, kubie ume.
MAT 27:51 Nʼotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke ụlọnsọ ahụ gbawara site nʼelu ruo nʼala. Ala makwara jijiji. Nkume tiwasịkwara.
MAT 27:52 Ala ili meghere. A hụrụ ọtụtụ ndị nsọ, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nʼọnwụ bilie.
MAT 27:53 Mgbe ha sitere nʼọnwụ bilie, ha hapụrụ ili ha banye nʼime obodo nsọ, gosikwa ọtụtụ mmadụ onwe ha.
MAT 27:54 Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”
MAT 27:55 Ọtụtụ ụmụ nwanyị nọ nʼebe ahụ, ndị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme. Ha si Galili soro Jisọs, na-ejere ya ozi.
MAT 27:56 Nʼime ha bụ Meri Magdalin, na Meri nne Jemis na Josef, na nne ụmụ Zebedi.
MAT 27:57 Mgbe o ruru anyasị, otu onye ọgaranya si Arimatia aha ya bụ Josef. Onye ya onwe ya bụkwa onye na-eso ụzọ Jisọs,
MAT 27:58 jekwuuru Pailet rịọọ ya ka e bunye ya ozu Jisọs. Pailet nyere iwu ka e bunye ya ozu ahụ.
MAT 27:59 Josef buuru ozu ya, were ezi akwa ọcha linin na-enwu enwu fụchie ya,
MAT 27:60 ma gaa lie ya nʼili ọhụrụ nke o gwuuru onwe ya, nʼetiti nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kpuchie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa.
MAT 27:61 Meri Magdalin na Meri nke ọzọ nọ na-ebe ahụ, ha nọdụrụ ala na ncherita ihu ili ahụ.
MAT 27:62 Nʼechi ya, nke bụ ụbọchị na-eso ụbọchị Nkwadebe, ndịisi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ jekwuru Pailet.
MAT 27:63 Ha kwuru sị, “Nna anyị ukwu, anyị na-echeta na mgbe onye ụgha ahụ dị ndụ, ọ sịrị na ya ga-esi nʼọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị.
MAT 27:64 Ya mere, nye iwu ka ndị agha gị na-eche ili ya nche, ruo mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Nke a ga-egbochi ndị na-eso ụzọ ya ịga zuru ozu ya. Ka ha ghara ị sịkwa ndị mmadụ na o sitela nʼọnwụ bilie. Ọ bụrụ na ha agha ụgha dị otu a, ọ ga-ajọrọ anyị njọ mgbe ahụ karịa na mbụ.”
MAT 27:65 Pailet gwara ha sị, “Unu nwere otu ndị agha na-eche nche, kpọrọnụ ha gaa mechisie ili ahụ ike dị ka unu si maara eme.”
MAT 27:66 Ya mere, ha kpọrọ ndị agha gaa mechizie ọnụ ili ahụ. Ha kakwara akara nʼelu nkume ahụ.
MAT 28:1 Mgbe ụbọchị izuike gasịrị, nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nʼime izu ụka, Meri Magdalin na Meri nke ọzọ, gara ka ha lee ili ahụ.
MAT 28:2 Na mberede, oke ala ọma jijiji malitere. Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe rịdata, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ, nọkwasịkwa nʼelu ya.
MAT 28:3 Ihu ya na-enwu dị ka amụma. Uwe ya na-achakwa ọcha dị ka akụmmiri igwe.
MAT 28:4 Nʼihi egwu ya, ndị nche makwara jijiji. Daa nʼala nọrọ dị ka ndị nwụrụ anwụ.
MAT 28:5 Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ sị ha, “Unu atụla egwu, nʼihi na amaara m na ọ bụ Jisọs onye a kpọgburu nʼelu obe ka unu na-achọ.
MAT 28:6 Ọ nọkwaghị nʼebe a. O sitela nʼọnwụ bilie, dị ka o si kwuo. Bịanụ lee ebe ọ tọgbọburu.
MAT 28:7 Gaanụ ngwangwa gwa ndị na-eso ụzọ ya na e meela ka o si nʼọnwụ bilie. Lee, o burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya. Chetakwanụ ihe m gwara unu.”
MAT 28:8 Ha ji oke egwu na ọṅụ pụọ ọsịịsọ site nʼili ahụ, gbara ọsọ gawa ịkọrọ ndị na-eso ụzọ ya.
MAT 28:9 Na mberede, Jisọs zutere ha sị ha, “Ndeewonụ!” Ha bịakwutere ya, jide ụkwụ ya abụọ aka, kpọọkwa isiala nye ya.
MAT 28:10 Ya mere Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu. Gaanụ, gwanụ ụmụnne m ka ha gaa Galili. Ha ga-ahụ m nʼebe ahụ.”
MAT 28:11 Mgbe ha na-aga, ụfọdụ ndị agha chere ili ahụ nche batara nʼime obodo. Ha gara kọọrọ ndịisi nchụaja ihe niile mere.
MAT 28:12 Emesịa, ndị nchụaja na ndị okenye zukọtara kwekọrịtaa inye ndị agha ahụ ọkpụrụkpụ ego,
MAT 28:13 sị ha, “Ihe a ka unu ga-ekwu, ‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼabalị zuru ya nʼohi mgbe anyị nọ na-arahụ ụra.’
MAT 28:14 Ọ bụrụ na nke a eruo gọvanọ ntị, anyị ga-emeta ya mma, ma mee ka unu pụọ na nsogbu.”
MAT 28:15 Ha naara ego ahụ, meekwa dị ka e ziri ha. Akụkọ a ka a gbasara nʼetiti ndị Juu ruo taa.
MAT 28:16 Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa.
MAT 28:17 Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ.
MAT 28:18 Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m.
MAT 28:19 Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.
MAT 28:20 Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.”
MAR 1:1 Mmalite oziọma maka Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke.
MAR 1:2 Dịka e dere ya rịị nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị.”
MAR 1:3 “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ”
MAR 1:4 Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.
MAR 1:5 Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan.
MAR 1:6 Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.
MAR 1:7 O kwusara sị: “Onye dị ike karịa m na-abịa nʼazụ m. Onye m na-erughị ihudata ala tọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.
MAR 1:8 Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
MAR 1:9 Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim.
MAR 1:10 Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya.
MAR 1:11 Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
MAR 1:12 Ngwangwa, Mmụọ Nsọ duuru ya baa nʼime ọzara.
MAR 1:13 Ọ nọkwara nʼime ọzara ahụ iri ụbọchị anọ, ebe ekwensu nwara ya ọnwụnwa. Ya na ụmụ anụ ọhịa nọkwa. Ma ndị mmụọ ozi jeere ya ozi.
MAR 1:14 Mgbe e tinyesịrị Jọn nʼụlọ mkpọrọ, Jisọs gara na Galili, na-ekwusa oziọma Chineke.
MAR 1:15 Ọ sịrị, “Oge ahụ eruola, alaeze Chineke dị nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ nʼoziọma.”
MAR 1:16 Mgbe Jisọs na-aga nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ Saimọn na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha nʼime mmiri nʼihi na ha bụ ndị ọkụ azụ.
MAR 1:17 Jisọs siri ha, “Bịanụ soro m, m ga-emekwa unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”
MAR 1:18 Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha ma soro ya.
MAR 1:19 Mgbe ọ gatụrụ nʼihu nke nta, ọ hụrụ Jemis nwa Zebedi na nwanne ya bụ Jọn ndị nọ nʼime ụgbọ mmiri, na-ekezi ụgbụ azụ ha.
MAR 1:20 Ngwangwa, ọ kpọrọ ha, ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị o goro ọrụ nʼime ụgbọ soro ya.
MAR 1:21 Ha gara Kapanọm, mgbe ụbọchị izuike ruru, ọ bara nʼime ụlọ ekpere ma malite izi ha ihe.
MAR 1:22 Ozizi ya juru ha anya nke ukwuu, nʼihi na o ziri ha ihe dịka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka nke ndị ozizi iwu.
MAR 1:23 Ma nʼotu oge ahụ, otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya, tiri mkpu nʼoke olu,
MAR 1:24 sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Jisọs onye Nazaret? Ị bịala ịla anyị nʼiyi? Amaara m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.”
MAR 1:25 Ma Jisọs baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!”
MAR 1:26 Mmụọ ahụ na-adịghị ọcha seere ya, mee ka ahụ ya maa jijiji, o tiri mkpu nʼoke olu, ma sikwa nʼime ya pụta.
MAR 1:27 Ha niile bụ ndị nọ nʼọnọdụ ihe iju anya ma na-ajụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a? Ozizi ọhụrụ ya na ikike! Ọ na-enye ọ bụladị mmụọ na-adịghị ọcha iwu. Ha na-erubekwara ya isi.”
MAR 1:28 Akụkọ banyere ya gbasara ngwangwa ruo akụkụ niile nke Galili.
MAR 1:29 Ngwangwa ha hapụrụ ụlọ ekpere ahụ, ha na Jemis na Jọn soro banye nʼụlọ Saimọn na Andru.
MAR 1:30 Nʼoge a, nne nwunye Saimọn dina nʼakwa ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha mere ka ọ mata banyere ya.
MAR 1:31 Ọ gakwuru ya, jide ya nʼaka selite ya elu. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. Ọ malitekwara ile ha ọbịa.
MAR 1:32 Nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ha kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike na ndị mmụọ ọjọọ bi nʼime ha.
MAR 1:33 Obodo ahụ niile gbakọrọ nʼọnụ ụzọ.
MAR 1:34 Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ.
MAR 1:35 Nʼisi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbachiri, o biliri, ga ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, naanị ya. Nʼebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere.
MAR 1:36 Saimọn na ndị ya na ha nọ pụrụ na-achọgharị ya.
MAR 1:37 Ma mgbe ha hụrụ ya, ha sịrị ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị!”
MAR 1:38 Ọ zaghachiri ha sị, “Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, nʼobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m zisakwaara ha oziọma. Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa.”
MAR 1:39 Ya mere, ọ pụrụ jegharịa na Galili niile na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere ha niile, na-achụpụkwa mmụọ ọjọọ.
MAR 1:40 Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
MAR 1:41 Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, dị ọcha!”
MAR 1:42 Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka ọ dị ọcha.
MAR 1:43 Mgbe ahụ, Jisọs ji ịdọ aka na ntị zilaga ya,
MAR 1:44 ọ gwara ya sị, “Hụkwa na ọ dịghị onye ọbụla ị ga-agwa ihe a. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu, maka ime ka ị dị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”
MAR 1:45 Ma ọ pụrụ malite ịkọsa akụkọ banyere ọgwụgwọ ya ebe niile. Nʼihi ya Jisọs enwekwaghị ike ịbanye nʼobodo, kama ọ gara nọrọ nʼebe zoro ezo. Ma ndị mmadụ na-abịakwutekwa ya site nʼebe niile dị iche iche.
MAR 2:1 Mgbe ụbọchị ole na ole gafesịrị, ọ bataghachiri na Kapanọm. Ndị mmadụ nụrụ na ọ lọghachila.
MAR 2:2 Igwe mmadụ zukọtara nʼime ụlọ ahụ nke mere na ohere afọdụghị ọ bụladị nʼọnụ ụzọ. O kwusakwaara ha oziọma.
MAR 2:3 Ndị ikom ụfọdụ buteere ya otu nwoke ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ bụ mmadụ anọ bu ya.
MAR 2:4 Ebe ha na-enweghị ike ibutere ya Jisọs nʼihi igwe mmadụ, ha gwupuru oghere nʼelu ụlọ ebe ahụ ọ nọ. Mgbe ha gwupusiri ya, ha budatara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼute o jiri dina.
MAR 2:5 Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Nwa m nwoke, agbagharala gị mmehie gị.”
MAR 2:6 Ma ụfọdụ ndị ozizi iwu nọdụrụ ala nʼebe ahụ na-eche nʼime obi ha sị,
MAR 2:7 “Gịnị mere onye a ji na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmehie ma ọ bụghị naanị Chineke?”
MAR 2:8 Ngwangwa Jisọs matara nʼime mmụọ ya na ha na-atule okwu a nʼime obi ha. Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe dị otu a nʼobi unu?
MAR 2:9 Olee nke ka mfe: ọ bụ ịgwa onye a akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ i sị, ‘Bilie chịrị ute gị jegharịa?’
MAR 2:10 Ma igosi unu na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ,
MAR 2:11 “Ana m asị gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị.”
MAR 2:12 O biliri, chịrị ute ya pụọ nʼihu mmadụ niile. Nke a juru ndị niile nọ nʼebe ahụ anya. Ha toro Chineke na-asị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a mbụ!”
MAR 2:13 Emesịa, Jisọs pụrụ gaa nʼakụkụ osimiri ahụ. Igwe mmadụ bịakwutere ya. Ọ malitere izi ha ihe.
MAR 2:14 Mgbe ọ na-aga nʼihu, ọ hụrụ Livayị nwa Alfiọs ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m,” o biliri sooro ya.
MAR 2:15 Mgbe ọ na-eri nri uhuruchi nʼụlọ Livayị, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ ebe ahụ, nʼihi na ndị na-esogharị ya dị ọtụtụ.
MAR 2:16 Mgbe ndị ozizi iwu nke ndị Farisii hụrụ ya ka o so ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere o ji eso ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-erikọ nri?”
MAR 2:17 Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị ha, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike. Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume kama ndị mmehie.”
MAR 2:18 Nʼoge a, ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị Farisii na-ebu ọnụ. Ndị mmadụ bịara jụọ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma ndị nke gị adịghị ebu ọnụ?”
MAR 2:19 Jisọs sịrị ha, “O kwesiri na ndị a kpọrọ oriri ọlụlụ di na nwunye ga-ebu ọnụ mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ nʼetiti ha? Ha apụghị ibu ọnụ ogologo oge ya na ha nọ.
MAR 2:20 Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Nʼụbọchị ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.
MAR 2:21 “Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa. Ọ bụrụ na o mee nke a, akwa ọhụrụ ahụ ga-adọkapụ site na nke ochie mee ka ndọka ya dị njọ karịa.
MAR 2:22 Ọ dịghị onye na-agbanye mmanya ọhụrụ na karama akpụkpọ ochie. O mee nke a, mmanya ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ ochie ahụ, mee ka karama na mmanya laa nʼiyi. Ee, a na-agbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.”
MAR 2:23 Otu ụbọchị izuike, ya na ndị na-eso ụzọ ya na-agafe nʼubi a kụrụ ọka. Dị ka ha na-agafe, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọ ụfọdụ ogbe ọka nʼime ọka ndị ahụ.
MAR 2:24 Ndị Farisii siri ya, “Lee, gịnị mere ha ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike.”
MAR 2:25 Ma ọ sịrị ha, “Unu agụtaghị ihe Devid na ndị so ya mere mgbe agụụ gụrụ ha?
MAR 2:26 Nʼoge Abịata bụ onyeisi nchụaja, ọ banyere nʼụlọ Chineke taa achịcha e chere nʼihu ya, nke ziri ezi na ọ bụ naanị ndị nchụaja kwesiri ịta ya. O nyetụkwara ndị ya na ha so.”
MAR 2:27 Mgbe ahụ, ọ gwakwara ha sị, “E mere ụbọchị izuike maka mmadụ, emeghị mmadụ maka ụbọchị izuike.”
MAR 2:28 Ya mere, Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ọ bụladị ụbọchị izuike.
MAR 3:1 Nʼoge ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere, otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọkwa nʼebe ahụ.
MAR 3:2 Ụfọdụ ha nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ya ọrịa nʼụbọchị izuike.
MAR 3:3 Ma ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị, “Bilie guzoro nʼetiti ebe a.”
MAR 3:4 Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Olee nke ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike: ọ bụ ime ezi ihe ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?” Ma ha gbachiri nkịtị.
MAR 3:5 O lere ha anya nʼiwe, o wutere ya nʼihi na obi ha kpọrọ nkụ. Ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” O setịpụrụ aka ya, aka ya dizikwara nke ọma.
MAR 3:6 Ngwangwa, ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ nʼiwe. Gaa soro ndị otu Herọd gbaa izu otu ha ga-esi laa ya nʼiyi.
MAR 3:7 Ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nʼebe ahụ pụọ gaa nọdụ nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ ndị sitere na Galili sooro ya.
MAR 3:8 Mgbe ha nụrụ ihe niile ọ na-eme, ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya site na Judịa, na Jerusalem, na Idumia na obodo ndị dị nʼofe Jọdan, na gburugburu Taịa na Saịdọn.
MAR 3:9 Nʼihi ịdị ukwuu nke igwe mmadụ ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha debere ya ụgbọ mmiri nta nso ka ọ banye, iji gbochie igwe mmadụ ahụ ịkpagbu ya.
MAR 3:10 Nʼihi na ọ gwọọla ọtụtụ ndị ọrịa, nke mere na ndị bu ọrịa dị iche iche na-agbalịsị ike ịmetụ ya aka.
MAR 3:11 Mgbe ọbụla kwa ndị mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ha hụrụ ya, ha na-ada nʼala nʼihu ya na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke!”
MAR 3:12 Ma ọ na-enyesi ha iwu ike ka ha hapụ ịkọwa onye ọ bụ.
MAR 3:13 Ọ rigooro nʼelu ugwu ma kpọrọ ndị ọ chọrọ nye onwe ya. Ha bịakwutekwara ya.
MAR 3:14 Ọ họpụtara mmadụ iri na abụọ ndị ya na ha ga-anọ, mee ha ndị ozi. Ndị ọ ga-ezipụ ikwusa oziọma,
MAR 3:15 nakwa ndị ga-enwe ikike ịchụpụ mmụọ ọjọọ.
MAR 3:16 Ndị a bụ mmadụ iri na abụọ ndị ọ họpụtara. Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita).
MAR 3:17 Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya (ndị ọ gụgharịrị aha Boanajis, nke pụtara “ụmụ egbe eluigwe”),
MAR 3:18 Andru, Filip, Batalomi, Matiu, Tọmọs, Jemis nwa Alfiọs, Tadiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt,
MAR 3:19 na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye.
MAR 3:20 Emesịa, ọ lọtara nʼụlọ, ma igwe mmadụ gbakọtakwara ọzọ nke mere na ha enweghị ohere iri nri.
MAR 3:21 Mgbe ndị ikwu ya nụrụ nke a, ha bịara gbalịa idulata ya nʼụlọ ha, nʼihi na ndị mmadụ na-asị, “Isi adịghị ya mma.”
MAR 3:22 Ma ndị ozizi iwu si Jerusalem bịa sịrị, “Mmụọ Belzebub bi nʼime ya! Ọ bụkwa nʼike onyeisi ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.”
MAR 3:23 Ma ọ kpọrọ ha jiri ilu gwa ha okwu sị, “Ekwensu ọ pụrụ ịchụpụ ekwensu?
MAR 3:24 Ọ bụrụ na alaeze ekewa megide onwe ya alaeze ahụ apụghị iguzo.
MAR 3:25 Ọ bụrụ na ezinaụlọ ekewa megide onwe ya, ezinaụlọ ahụ apụghị iguzo.
MAR 3:26 Ọ bụrụkwa na ekwensu ebilie megide onwe ya si otu a nwee nkewa, o nweghị ike iguzo; kama ọgwụgwụ oge ya abịala nso.
MAR 3:27 Nʼezie, ọ dịghị onye nwere ike ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo ya niile, ma o bughị ụzọ kee nwoke ahụ siri ike agbụ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe ike ịbanye nʼụlọ ya, zukọrọ ngwongwo ya niile.
MAR 3:28 Nʼezie agwa m unu, na a ga-agbaghara ụmụ mmadụ mmehie na nkwulu niile nke ha kwuru.
MAR 3:29 Ma onye ọbụla ga-ekwulu Mmụọ Nsọ, enweghị ike ịgbaghara ya. Ọ bụ onye ikpe mmehie ebighị ebi mara.”
MAR 3:30 O kwuru nke a nʼihi na ha na-asị, “Mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya.”
MAR 3:31 Mgbe ahụ, nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke bịara, guzoro nʼezi. Ha ziri ozi ka a kpọọ ya.
MAR 3:32 Igwe mmadụ gbara ya gburugburu mgbe ahụ gwara ya sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na ndị nwanyị guzo nʼezi. Ha chọrọ ịhụ gị.”
MAR 3:33 Ọ zara sị, “Onye bụ nne m, ndị ole bụkwa ụmụnne m ndị nwoke?”
MAR 3:34 Mgbe ahụ, o lere ndị nọ ya gburugburu anya ma sị, “Ndị a bụ nne m, na ụmụnne m ndị nwoke!
MAR 3:35 Onye ọbụla na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.”
MAR 4:1 Nʼoge ọzọ, ọ malitere izi ihe nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ dị ukwuu gbara ya gburugburu, nke mere na ọ banyere nʼime ụgbọ nọdụ ala nʼime ya nʼelu mmiri ahụ, ma igwe mmadụ ahụ nọkwa nʼakụkụ osimiri ahụ.
MAR 4:2 O bidoro i kuziri ha ọtụtụ ihe nʼilu, ma nʼozizi ya, ọ sịrị ha,
MAR 4:3 “Geenụ ntị! Otu onye ọrụ ubi pụrụ gaa ịkụ mkpụrụ ya.
MAR 4:4 Mgbe ọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ bịara tụtụrịa ha.
MAR 4:5 Ụfọdụ mkpụrụ dara nʼala nkume, ebe aja ntakịrị dị. Ha puputara ngwangwa nʼihi na ala dị nʼebe ahụ emighị emi.
MAR 4:6 Ma mgbe anwụ wara, ọ chagburu ha, ha kpọnwụọ nʼihi na ha enweghị mgbọrọgwụ.
MAR 4:7 Mkpụrụ ndị ọzọ dara nʼetiti ogwu; ogwu ahụ tolitere kpagbuo ha. Ha amịkwaghị mkpụrụ.
MAR 4:8 Mkpụrụ ndị ọzọ nke dara nʼezi ala, puru, tolite, ma mịa mkpụrụ na mmụba iri atọ, iri isii, ọ bụladị otu narị.”
MAR 4:9 Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
MAR 4:10 Ma mgbe ọ nọ naanị ya, ndị ozi iri na abụọ ahụ na ndị ọzọ nọ ya gburugburu jụrụ ya ajụjụ banyere ilu ahụ.
MAR 4:11 Ọ gwara ha sị, “Enyela unu ihe omimi nke alaeze Chineke. Ma ndị nọ nʼezi, a na-agwa ha ihe niile nʼilu,
MAR 4:12 nke mere na, “ ‘Ha ga na-ele anya, hụkwa, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla, ha ga na-anụ, nụkwa, ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla, ma ọ bụghị ya, ha nwere ike chigharịa bụrụ ndị a gbaghaara.’ ”
MAR 4:13 Mgbe ahụ, ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ na unu aghọtaghị ilu a? Unu ga-esikwa aṅaa ghọta ilu ndị ọzọ?
MAR 4:14 Ọgha mkpụrụ ahụ na-agha okwu Chineke.
MAR 4:15 Mmadụ ụfọdụ dị ka mkpụrụ ndị ahụ dara nʼakụkụ ụzọ, ebe a kụrụ okwu ahụ. Ngwangwa ha nụrụ ya, ekwensu na-abịa napụ ha okwu ahụ nke a kụrụ nʼime ha.
MAR 4:16 Ndị ọzọ dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼala nkume. Ha nụrụ okwu ahụ, were ọṅụ nabata ya nʼotu mgbe ahụ.
MAR 4:17 Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha, ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ.
MAR 4:18 Ndị nke ọzọkwa, dị ka mkpụrụ dara nʼetiti ogwu, nụrụ okwu ahụ;
MAR 4:19 ma nchekasị nke ndụ a,na nghọgbu nke akụnụba, na oke ọchịchọ, nakwa ihe ndị ọzọ na-abata, kpagbuo okwu ahụ, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ.
MAR 4:20 Ndị ọzọ, dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼezi ala, nụrụ okwu ahụ, nabata ya ma mịa mkpụrụ dị iri atọ, iri isii, maọbụ otu narị.”
MAR 4:21 Ọ sịrị ha, “A na-ebute oriọna ka e jiri efere kpuchie ya maọbụ dọnye ya nʼokpuru akwa ndina? Ọ bụghị ka a dọba ya nʼelu ihe ịdọba iheọkụ?
MAR 4:22 Nʼihi na ihe niile e zoro ezo ga-apụta ihe ma ihe niile e kpuchiri ekpuchi ka a ga-emesịa kpughee.
MAR 4:23 Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
MAR 4:24 Ọ sịrị ha, “Kpacharanụ anya ihe unu na-anụ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu, maọbụ karịa.
MAR 4:25 Onye nwere ihe ka a ga-enye karịa; onye na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere ka a ga-anapụ ya.”
MAR 4:26 Ọ sịkwara, “Alaeze Chineke yiri ihe dị otu a. Ọ dịka mgbe otu onye ghara mkpụrụ nʼala ubi.
MAR 4:27 Ehihie na abalị, ma ọ nọ nʼụra ma o tetara, mkpụrụ ahụ na-epupụte na-etokwa, ma ọ maghị ka o si na-eme.
MAR 4:28 Ala ahụ nʼonwe ya na-eme ka mkpụrụ ahụ puo. Ọ na-epupụte na mbụ, too oko, emesịa isi ọka, nʼikpeazụ ọ mịkwara mkpụrụ kara aka nʼoko ya.
MAR 4:29 Mgbe ọka ahụ chara ịghọ ya, o na-eji mma iwe ihe ubi ya bịa gbutuo ọka ahụ, ghọrọkwa ogbe ọka laa, nʼihi na oge iwe ihe nʼubi eruola.”
MAR 4:30 Ọzọkwa, ọ sịrị, “Gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ịsị na alaeze Chineke yiri? Ụdị ilu dị aṅaa ka anyị ga-eji kọwaa ya?
MAR 4:31 Ọ dị ka mkpụrụ mọstaadị, nke bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta nke a na-akụ nʼala.
MAR 4:32 Ma mgbe a kụrụ ya, ọ na-eto bukarịa ihe niile a kụrụ nʼubi, ọ na-enwe alaka dị ukwuu nke bụ na ụmụ anụ ufe nke eluigwe na-ezukwa ike nʼokpuru ya.”
MAR 4:33 O jiri ọtụtụ ilu yiri ndị a gwa ha okwu dị ka ha pụrụ ịghọta.
MAR 4:34 O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu. Ma ya na ndị na-eso ụzọ ya naanị nọdụ, ọ na-akọwara ha ihe niile.
MAR 4:35 Nʼụbọchị ahụ nʼoge uhuruchi, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ.”
MAR 4:36 Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ ma kpọrọ ya, otu ọ dị, ya na ha banyere nʼime ụgbọ. Ụgbọ ndị ọzọ dịkwa na-eso ya.
MAR 4:37 Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya.
MAR 4:38 Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?”
MAR 4:39 Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, “Kwụsị! Dere jii!” Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii.
MAR 4:40 Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? Ọ bụ na unu enwebeghị okwukwe?”
MAR 4:41 Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!”
MAR 5:1 Ha gafere nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ nʼakụkụ obodo Gerazin.
MAR 5:2 Mgbe Jisọs sitere nʼụgbọ ahụ pụta, otu nwoke mmụọ na-adịghị ọcha si nʼebe a na-eli ozu bịa zute ya.
MAR 5:3 Nwoke a bi nʼetiti ili ndị ahụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ike ya agbụ, ọ bụladị iji eriri igwe kee ya.
MAR 5:4 Nʼihi na e keela ya agbụ ụkwụ nʼaka ọtụtụ oge ma ọ dọbisiri eriri igwe ndị ahụ, gbajisiekwa mkpọrọ igwe dị ya nʼụkwụ. Ọ dịkwaghị onye nwere ike ijideli ya.
MAR 5:5 Ọ na-agagharị nʼetiti ili ahụ ehihie na abalị na nʼugwu dị ya gburugburu, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ.
MAR 5:6 Mgbe o sitere nʼebe dị anya hụ Jisọs, ọ gbaara ọsọ gaa gbuo ikpere nʼihu ya.
MAR 5:7 O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko, atala m ahụhụ.”
MAR 5:8 Nʼihi na o nyela ya iwu sị, “Si nʼime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha!”
MAR 5:9 Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Mmụọ ọjọọ ahụ zaghachiri ya sị, “Aha m bụ Lijiọn, nʼihi na anyị dị ọtụtụ.”
MAR 5:10 Ma ọ rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara ịchụpụ ha site nʼobodo ahụ.
MAR 5:11 Igwe ezi nọ nso nʼebe ahụ na-akpa nri, na ndịda ugwu dị nʼebe ahụ.
MAR 5:12 Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya sị, “Biko ziga anyị nʼetiti igwe ezi ndị a, ma hapụ anyị ka anyị banye nʼime ha.”
MAR 5:13 Ọ hapụrụ ha; mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha pụtara baa nʼime igwe ezi ndị ahụ. Igwe ezi ahụ niile, ọnụọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nʼime osimiri ebe mmiri riri ha niile.
MAR 5:14 Ndị na-elekọta igwe ezi ahụ gbaara ọsọ laa, kọsaa ihe mere nʼime obodo nakwa nʼala ahụ niile. Nʼihi nke a, ọtụtụ mmadụ pụtara ilere ihe mere.
MAR 5:15 Ha bịakwutere Jisọs, hụ nwoke ahụ nke igwe mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. O yi uwe, nọdụ ala, bụrụkwa onye uche ya zuruoke; egwu jidere ha.
MAR 5:16 Ndị hụrụ ihe mere kọọrọ ihe niile mere nwoke ahụ mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. Ha kọkwaara ihe mere igwe ezi ndị ahụ.
MAR 5:17 Mgbe ahụ, ha bidoro ịrịọ Jisọs ka ọ pụọra ha nʼakụkụ ala ha.
MAR 5:18 Dị ka ọ na-achọ ịbanye nʼime ụgbọ, nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ bibu nʼime ya rịọrọ ya ka o soro ha.
MAR 5:19 Ma Jisọs ekweghị, kama ọ sịrị ya, “Laa nʼụlọ, lakwuru ndị enyi gị, kọọrọ ha ihe ọma Onyenwe anyị meere gị, na otu o si meere gị ebere.”
MAR 5:20 Ya mere, o si nʼebe ahụ pụọ, malitekwa ịkọsa nʼime mpaghara Dekapọlịs ihe ọma Jisọs meere ya. Ihe a juru mmadụ niile anya.
MAR 5:21 Mgbe Jisọs jiri ụgbọ mmiri gafee nʼakụkụ nke ọzọ, ọtụtụ igwe mmadụ zukọrọ gbaa ya gburugburu mgbe ọ nọ nʼakụkụ osimiri.
MAR 5:22 Ma otu nʼime ndịisi ụlọ ekpere nke aha ya bụ Jairọs bịara, mgbe ọ hụrụ ya, ọ dara nʼala nʼụkwụ ya,
MAR 5:23 rịọsie ya arịrịọ ike sị, “Ada m nwanyị nke nta nọ nʼọnụ ọnwụ ugbu a. Biko, bịa ka ị bikwasị ya aka gị ka agwọ ya, ka ọ dịkwa ndụ.”
MAR 5:24 Ya mere, Jisọs soro ya gawa. Oke igwe mmadụ sokwa ya na-akpagbu ya.
MAR 5:25 Ma otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ.
MAR 5:26 Ọ taala ahụhụ dị ukwuu nʼaka ndị dibịa, mefukwaa ihe niile o nwere. Ma kama ọrịa ya ịdị mma, ọ na-aga nʼihu ịdị njọ.
MAR 5:27 Ebe ọ nụrụla akụkọ banyere Jisọs, o sooro igwe mmadụ ndị ahụ, sitere nʼazụ metụ uwe ya aka.
MAR 5:28 Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m enwe ike metụ naanị uwe ya aka, a ga-agwọkwa m.”
MAR 5:29 Ngwangwa oruru ọbara ya kwụsịrị. Ọ matakwara nʼime onwe ya na ya enwerela onwe ya site nʼọrịa ya.
MAR 5:30 Nʼotu oge ahụ Jisọs matara na ike esitela ya nʼahụ pụọ. Ọ tụgharịrị gburugburu nʼetiti igwe mmadụ ahụ jụọ sị, “Onye metụrụ uwe m aka?”
MAR 5:31 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee ọtụtụ igwe mmadụ gbara gị gburugburu, i sikwa aṅaa na-ajụ, ‘Onye metụrụ uwe m aka?’ ”
MAR 5:32 Ma Jisọs gara nʼihu na-ele anya gburugburu ịhụ onye mere ya.
MAR 5:33 Ma nwanyị ahụ, ebe ọ matara ihe mere nʼahụ ya, bịara nʼegwu nʼịma jijiji daa nʼụkwụ ya, gwa ya eziokwu niile.
MAR 5:34 Ọ sịrị ya, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo nwerekwa onwe gị site nʼọrịa gị.”
MAR 5:35 Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, ụfọdụ ndị mmadụ sitere nʼụlọ onyeisi ụlọ ekpere bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, olee ihe mere i ji esogbu onye ozizi a ọzọ?”
MAR 5:36 Ma ka ọ nụrụ ihe ha kwuru, Jisọs gwara onyeisi ụlọ ekpere ahụ sị ya, “Atụla egwu, naanị kwere.”
MAR 5:37 O kweghị ka onye ọbụla ọzọ soro ya ma ọ bụghị Pita, na Jemis na Jọn nwanne Jemis.
MAR 5:38 Mgbe ha bịarutere nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ahụ, ọ nụrụ ụzụ hụkwa ọtụtụ mmadụ ka ha nọ na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa.
MAR 5:39 Mgbe ọ batara, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa? Nwatakịrị a anwụghị anwụ, ọ na-arahụ ụra!”
MAR 5:40 Ma ha chịrị ya ọchị. Mgbe ọ chụpụsịrị ha niile nʼezi, ọ kpọọrọ nne na nna nwantakịrị ahụ, na ndị ya na ha so, banye nʼime ụlọ ebe nwantakịrị ahụ dina.
MAR 5:41 O jidere ya nʼaka sị ya, “Talita koum!” (nke pụtara, “Nwa agbọghọ nta, asị m gị bilie!”).
MAR 5:42 Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (ọ gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu.
MAR 5:43 Ma ọ dọsiri ha aka na ntị ike, ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe mere. Ọ sịrị ha, “Nyenụ ya nri ka o rie.”
MAR 6:1 Ọ sitere nʼebe ahụ pụọ laghachi nʼobodo nke a mụrụ ya. Ndị na-eso ụzọ ya sooro ya gaa.
MAR 6:2 Nʼụbọchị izuike, ọ banyere nʼụlọ ekpere bido izi ihe. Ozizi ya juru ọtụtụ ndị gere ya ntị anya. Ha kwuru sị, “Ebee ka nwoke si mụta ihe ndị a niile? Gịnịkwa bụ amamihe nke a e nyere ya? Lekwa ọrụ ebube nke a ọ rụrụ?
MAR 6:3 Onye a ọ bụghị onye kapinta ahụ? Ọ bụghị nwa Meri, bụrụkwa nwanne Jemis, Josef, Judas na Saimọn? Ụmụnne ya ndị inyom ha esoghị anyị nọrọ nʼebe a?” Iwe were ha nʼebe ọ nọ.
MAR 6:4 Ma Jisọs zara ha sị, “Onye amụma adịghị enwe nsọpụrụ ọbụla nʼobodo a mụrụ ya, na nʼetiti ndị ikwu ya na nʼezinaụlọ o siri pụta.”
MAR 6:5 Ọ rụghị ọrụ ebube ọbụla nʼebe ahụ. Ihe o mere bụ naanị ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka nʼisi gwọọ ha.
MAR 6:6 Enweghị okwukwe ha juru ya anya. O jegharịkwara nʼobodo nta niile gburugburu na-ezi ihe.
MAR 6:7 Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya, nye ha ikike zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha.
MAR 6:8 Ndị a bụ iwu o nyere: “Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, karịkwa mkpanaka. Unu ewela achịcha, maọbụ akpa, unu etinyela ego ọbụla nʼime belịt unu.
MAR 6:9 Yirinụ akpụkpọụkwụ unu, unu eyikwala karịa otu uwe.
MAR 6:10 Mgbe ọbụla unu banyere nʼụlọ ọbụla, nọgidenụ nʼebe ahụ ruo mgbe unu hapụrụ obodo ahụ.
MAR 6:11 Ma ọ bụrụ na obodo ọbụla anabataghị unu maọbụ egeghị unu ntị, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.”
MAR 6:12 Ha pụrụ kwusara ndị mmadụ ka ha chegharịa.
MAR 6:13 Ha chụpụrụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ, teekwa ọtụtụ ndị ahụ na-esighị ike mmanụ, gwọọ ha.
MAR 6:14 Eze Herọd nụrụ akụkọ banyere ya, nʼihi na aha Jisọs aghọọla okwu a kpụ nʼọnụ. Ụfọdụ na-asị, na ọ bụ “Jọn omee baptizim; na e meela ka o site na ndị nwụrụ anwụ bilie. Ọ bụkwa nke a mere ka ike ọrụ ebube ji dị nʼime ya.”
MAR 6:15 Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ Ịlaịja.” Ma ndị ọzọkwa kwuru na ọ bụ onye amụma dị ka otu nʼime ndị amụma mgbe ochie.
MAR 6:16 Ma mgbe Herọd nụrụ nke a, ọ sịrị, “Jọn onye ahụ m bipụrụ isi, emeela ka ọ site nʼọnwụ bilie!”
MAR 6:17 Nʼihi na Herọd nʼonwe ya nyererị iwu ka e jide Jọn kee ya agbụ tụba ya nʼụlọ mkpọrọ. O mere nke a nʼihi Herodịas bụrịị nwunye Filip nwanne ya, onye ọ kpọrọ dịka nwunye ya.
MAR 6:18 Nʼihi na Jọn gwara Herọd sị, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ nwunye nwanne gị nwoke.”
MAR 6:19 Nʼihi ya Herodịas bu iro nʼobi megide Jọn na-achọkwa ụzọ igbu ya, mana ọ pụghị ime nke a,
MAR 6:20 nʼihi na Herọd na-atụ egwu ma na-echekwa Jọn, ebe ọ maara na ọ bụ onye ezi omume na onye dị nsọ. Mgbe ọ nụrụ okwu ya, o nweghị udo nʼobi ma ige ya ntị na-amasị ya.
MAR 6:21 Nʼikpeazụ, ohere bịara mgbe Herọd kpọrọ oriri nʼụbọchị ncheta ọmụmụ ya nye ndị ọkwa ha dị elu nʼokpuru ọchịchị ya, ndịisi ndị ọchịagha na ndị bụ ndị ndu nʼobodo Galili.
MAR 6:22 Mgbe ada Herodịas bịara tee egwu, obi tọrọ Herọd na ndị niile ọ kpọrọ oriri ụtọ. Eze gwara nwaagbọghọ ahụ sị, “Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ aga m enyekwa gị ya.”
MAR 6:23 O kwere ya nkwa ṅụọkwa iyi sị, “Ihe ọbụla ị rịọrọ m aga m enye gị, ọ bụladị ọkara alaeze m.”
MAR 6:24 Ọ jekwuru nne ya jụọ ya sị, “Gịnị ka m ga-arịọ?” Ọ zara ya sị, “Isi Jọn omee baptizim.”
MAR 6:25 Ngwangwa, ọ bịakwutere eze rịọ ya sị, “Achọrọ m ka i nye m, ugbu a, nʼime efere, isi Jọn omee baptizim.”
MAR 6:26 O wutere eze nke ukwuu, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ, na nʼihi ndị ọ kpọrọ oriri, ọ chọghị ịjụ inye ya ihe ọ rịọrọ ya.
MAR 6:27 Ngwangwa o zipụrụ onye agha na-eche nche nye ya iwu ka ọ gaa bute isi Jọn. Ọ gara, bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ,
MAR 6:28 tinye isi ahụ nʼime efere butere nwaagbọghọ ahụ onye nara ya bunye nne ya.
MAR 6:29 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha bịara buru ozu ya gaa lie.
MAR 6:30 Ndị ozi Jisọs gbara ya gburugburu kọọrọ ya ihe niile ha mere, na ihe niile ha kuziri.
MAR 6:31 Nʼoge ahụ, nʼihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa na-apụkwa nke mere na ha enweghị ohere iri nri, ọ sịrị ha, “Soronụ m, unu niile, ka anyị ga ebe dị jụụ, zuo ike nwa oge nta.”
MAR 6:32 Ya mere ha pụrụ baa nʼime ụgbọ mmiri gaa nʼebe ha ga-anọdụrụ naanị onwe ha.
MAR 6:33 Ma ọtụtụ mmadụ ndị hụrụ ha mgbe ha na-apụ matara ha, sitekwara nʼobodo niile dị ebe ahụ gburugburu gbara ọsọ gbaruo ebe ahụ tupu ya na ndị na-eso ụzọ ya abịaruo.
MAR 6:34 Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, nʼihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ọ malitekwara izi ha ọtụtụ ihe.
MAR 6:35 Nʼoge a, ọchịchịrị ebidola ịgba, nʼihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara gwa ya, “Ebe a bụ ọzara, chi ejiekwala.
MAR 6:36 Zilaga ndị a, ka ha gaa nʼobodo nta ndị dị gburugburu ebe a, zụtara onwe ha ihe ha ga-eri.”
MAR 6:37 Ma ọ zara sị ha, “Nyenụ ha ihe ha ga-eri.” Ha sịrị ya, “Anyị ga-eje ịzụta ogbe achịcha nke narị denarị abụọ, iji nye ha ka ha rie?”
MAR 6:38 Ma ọ jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta.” Mgbe ha chọpụtasịrị, ha sịrị, “Ogbe achịcha ise na azụ abụọ.”
MAR 6:39 Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ.
MAR 6:40 Ya mere, ha nọdụrụ ala, iri mmadụ ise nʼotu ebe, narị mmadụ nʼebe ọzọ.
MAR 6:41 Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile.
MAR 6:42 Ha niile riri rijuo afọ.
MAR 6:43 Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ.
MAR 6:44 Ọnụọgụgụ ndị nwoke riri ogbe achịcha ahụ dị puku mmadụ ise.
MAR 6:45 Ngwangwa, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye nʼụgbọ mmiri buru ya ụzọ gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri Betsaida, ebe ya onwe ya nọdụrụ izilaga igwe mmadụ ahụ.
MAR 6:46 Mgbe ndị a niile lachara, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere.
MAR 6:47 Mgbe uhuruchi bịara, ụgbọ mmiri ahụ nọ nʼetiti osimiri, ma naanị ya onwe ya nọ nʼelu ala.
MAR 6:48 Mgbe ọ hụrụ na ha nọ na nsogbu nʼihi na ikuku na-emegide ha, nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nʼelu mmiri ịbịakwute ha, ma o mere dị ka ọ chọrọ ịgafe ha.
MAR 6:49 Ma mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri, ha chere na ọ bụ mmụọ, tie mkpu akwa.
MAR 6:50 Nʼihi na ha niile hụrụ ya, oke ụjọ tụkwara ha. Na-atụfughị oge, ọ gwara ha sị, “Nweenụ obi ike! Ọ bụ m. Unu atụla egwu.”
MAR 6:51 Emesịa, ọ rịgokwuru ha nʼime ụgbọ mmiri ahụ, otu mgbe ahụ ikuku ahụ dara juu. Ihe ndị a jukwara ha anya nke ukwuu.
MAR 6:52 Obi ha mechiri emechi nʼihi na ha aghọtaghị ihe banyere ọrụ ebube ogbe achịcha ndị ahụ.
MAR 6:53 Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha rutere nʼala Genesaret ebe ha kedoro ụgbọ ha.
MAR 6:54 Ma ngwangwa ha pụtara nʼụgbọ, ndị nọ nʼebe ahụ matara onye ọ bụ.
MAR 6:55 Ha gbaara ọsọ gaa nʼobodo nta niile dị ebe ahụ gburugburu butere ya ndị ọrịa nʼute ebe ọbụla ha nụrụ na ọ nọ.
MAR 6:56 Ebe ọbụla ọ bara, nʼobodo ukwu maọbụ na obodo nta, maọbụ nʼubi, ndị mmadụ na-ebute ndị ọrịa nibe ha nʼahịa. Ha rịọrọ ya ka o kwere ka ha metụ ọ bụladị ọnụnụ uwe ya aka; ndị niile metụrụ ya aka nwetara ọgwụgwọ.
MAR 7:1 Mgbe ndị Farisii na ụfọdụ ndị ozizi iwu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu,
MAR 7:2 ha hụrụ na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ji aka na-adịghị ọcha, ya bụ aka a na-akwọghị akwọ, na-eri nri.
MAR 7:3 Ndị Farisii na ndị Juu niile adịghị eri nri ma ọ bụrụ na ha akwọghị aka, nʼihi na ha na-ejigidesi aka ike nʼozizi na omenaala nke ndị okenye.
MAR 7:4 Mgbe ọbụla ha si nʼahịa lọta, ha adịghị eri nri ma ọ bụghị ma ha sachara onwe ha. Ha na-edebekwa ọtụtụ omenaala ndị ọzọ dị ka ịsacha iko, na ite mmiri na ketụlụ.
MAR 7:5 Ya mere ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebi nʼusoro omenaala ndị okenye. Karịa iji aka na-adịghị ọcha rie nri ha?”
MAR 7:6 Ọ sịrị ha, “Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu; dị ka e dere ya sị, “ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.
MAR 7:7 Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’
MAR 7:8 Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa aka ike nʼomenaala nke mmadụ.”
MAR 7:9 Ma ọ gwakwara ha sị, “Unu nwere ụzọ dị mma nʼanya unu nke unu ji wezuga iwu Chineke ma were omenaala unu dochie nʼọnọdụ ya.
MAR 7:10 Nʼihi na Mosis sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nne maọbụ nna ya ka e gbuo ya.’
MAR 7:11 Ma unu na-asị, na ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya maọbụ nna ya, ‘Ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ kọban,’ (nke pụtara onyinye dịrị Chineke).
MAR 7:12 Nʼụzọ dị otu a, unu na-akwagide ndị mmadụ ka ha hapụ inyere nne na nna ha aka.
MAR 7:13 Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu, site nʼomenaala unu nke unu nyefere nʼaka ndị ọzọ. Ọ dịkwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ka nke a unu na-eme.”
MAR 7:14 Ọzọkwa, ọ kpọrọ igwe mmadụ ahụ sị ha, “Geenụ m ntị onye ọbụla, ma ghọtakwanụ nke a.
MAR 7:15 Ọ dịghị ihe ọbụla banyere nʼime mmadụ pụrụ imerụ mmadụ, kama ihe na-emerụ mmadụ bụ ihe ahụ na-esite nʼime ya na-apụta.”
MAR 7:16 Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
MAR 7:17 Mgbe ọ hapụrụ igwe ndị mmadụ ahụ banye nʼime ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya maka ilu a.
MAR 7:18 Ọ sịrị ha, “Unu ọ ka dị ka ndị na-enweghị nghọta? Ọ bụ unu aghọtaghị na ihe ọbụla banyere nʼime mmadụ apụghị imerụ ya.
MAR 7:19 Nʼihi na ihe dị otu a anaghị abanye nʼobi ha, kama ọ na-abanye nʼime afọ ha, si nʼebe ahụ a nyụpụ ya nʼụlọ nsị.” (Site nʼikwu otu a, o mere ka ihe oriri niile dị ọcha.)
MAR 7:20 Ọ sịkwara, “Ọ bụ ihe sitere nʼime mmadụ pụta na-emerụ ya.
MAR 7:21 Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ọjọọ niile si apụta, ya na ịkwa iko niile dị iche iche, izu ohi, igbu mmadụ,
MAR 7:22 ịkwa iko nke ndị nwere di na nwunye, ọchịchọ ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, ekworo, aghụghọ niile, adịghị ọcha niile, inwe anya ụfụ nʼebe ndị ọzọ nọ, nkwulu niile, nganga na enweghị uche ọbụla.
MAR 7:23 Ihe ọjọọ ndị a niile na-esite nʼime mmadụ a pụta. Ha bụkwa ihe na-emerụ mmadụ.”
MAR 7:24 Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa. Nʼebe ahụ ọ banyere nʼime otu ụlọ. Ma o nwekwaghị ike izo onwe ya, nʼagbanyeghị na ọ chọghị ka a mata na ọ nọ ebe ahụ.
MAR 7:25 Ngwangwa, otu nwanyị nwere otu nwa nwanyị ntakịrị nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya nụrụ maka ya, ọ bịara daa nʼụkwụ ya.
MAR 7:26 Nwanyị a bụ onye Griik a mụrụ nʼakụkụ Sairo-Fonisia. Ọ rịọrọ ya ka ọ chụpụrụ ya mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime nwa ya nwanyị.
MAR 7:27 Ọ sịrị ya, “Hapụ ka ụmụntakịrị buru ụzọ rie ihe, nʼihi na o zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.”
MAR 7:28 Ma ọ zaghachiri ya sị, “Onyenwe m, ma ụmụ nkịta na-erikwa iberibe nri ụmụntakịrị si na tebul tụpụ nʼala.”
MAR 7:29 Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Nwanyị, ị zara nke ọma, nʼihi ọsịsa gị, laa, mmụọ ọjọọ ahụ ahapụla nwa gị nwanyị ugbu a.”
MAR 7:30 Ọ laghachiri nʼụlọ ya, hụ nwantakịrị ahụ ka o dina nʼelu ihe ndina, mmụọ ọjọọ ahụ apụọkwala.
MAR 7:31 Emesịa, ọ hapụrụ akụkụ Taịa gabiga Saịdọn bịaruo nʼosimiri Galili ruo nʼobodo ndị dị na Dekapọlịs.
MAR 7:32 Ha duteere ya otu nwoke ntị chịrị, nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasị ya aka.
MAR 7:33 O duuru ya pụọ nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, rụnye ya mkpịsịaka nʼime ntị ya abụọ. Mgbe ahụ ọ gbụpụkwara ọnụ mmiri metụkwa ya aka nʼire.
MAR 7:34 O leliri anya nʼeluigwe sụọ ude sị ya, “Ef fata,” nke pụtara “Meghee!”
MAR 7:35 Ngwangwa, ntị ya meghere, a tọpụkwara ire ya, ọ malite ikwu okwu nke ọma.
MAR 7:36 Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla, ma mgbe ọ na-eme nke a ha gara nʼihu na-akọsa ya ebe niile.
MAR 7:37 Ọ tụrụ ha nʼanya nke ukwuu, ha kwuo sị, “O meela ihe niile nke ọma. Ọ na-eme ka ọ bụladị ndị ntị chiri nụ ihe, ma mee ka ndị ogbi kwuo okwu.”
MAR 8:1 Nʼoge ahụ, igwe mmadụ ọzọ zukọrọ. Ebe ha na-enweghị ihe ha ga-eri, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha,
MAR 8:2 “Enwere m ọmịiko nʼebe igwe mmadụ ndị a nọ. Nke a na-eme ya ụbọchị atọ anyị na ha nọ. Ugbu a, ha enweghị ihe ha ga-eri.
MAR 8:3 Ọ bụrụ na m ezilaga ha nʼụlọ ha, ụfọdụ nʼime ha ga-ada nʼụzọ nʼihi agụụ. Nʼihi na ụfọdụ ha si nʼebe dị anya bịa.”
MAR 8:4 Ndị na-eso ụzọ ya zara ya, “Ebee ka mmadụ ga-achọta achịcha ga-ezuru ndị a nʼime ọzara a?”
MAR 8:5 Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha zara sị, “Asaa.”
MAR 8:6 Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa ahụ kpee ekpere. Ọ nyawasịrị ha, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ niile. Ha kekwara ya nye igwe mmadụ ahụ.
MAR 8:7 Ha nwekwara azụ ole na ole. O weere ya kpee ekpere, ọ gwara ha ka ha kesaakwa ya.
MAR 8:8 Ha riri, rijuo afọ. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha dafuru nʼebe ndị a nọ rie nri. Ha tụtụjuru nkata asaa.
MAR 8:9 Ndị riri nri a ruru ihe dịka puku mmadụ anọ. Mgbe ahụ o zilagara ha.
MAR 8:10 Ngwangwa, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼakụkụ obodo Dalmanuta.
MAR 8:11 Ndị Farisii bịakwutere ya malite nrụrịta ụka, na-achọ ihe ịrịbama si nʼeluigwe, iji nwalee ya.
MAR 8:12 Ọ sụrụ ude nke ukwuu nʼime onwe ya sị, “Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe ịrịbama? Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, o nweghị ihe ịrịbama a ga-egosi ọgbọ a.”
MAR 8:13 Ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ banyekwa nʼụgbọ mmiri ọzọ, ịgafe nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ.
MAR 8:14 Ndị na-eso ụzọ ya chefuru iwere achịcha. Ọ bụ naanị otu ogbe achịcha fọdụụrụ ha nʼime ụgbọ.
MAR 8:15 Ọ dọrọ ha aka na ntị sị, “Kpacharanụ anya. Lepụnụ anya maka ihe na-eko achịcha ndị Farisii na nke Herọd.”
MAR 8:16 Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụ nʼihi na anyị enweghị achịcha.”
MAR 8:17 Mgbe Jisọs ghọtara isi mkparịta ụka ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ekwu okwu maka enweghị achịcha? Ọ pụtara na unu adịghị ahụ maọbụ aghọta? Obi unu o siri ike?
MAR 8:18 Unu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Unu nwere ntị ma unu adịghị anụ ihe? Ọ ga-abụ na unu adịghị echeta?
MAR 8:19 Mgbe m ji ogbe achịcha ise zụọ puku mmadụ ise, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata iri na abụọ.”
MAR 8:20 “Mgbe m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata asaa.”
MAR 8:21 Ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-enweghị nghọta?”
MAR 8:22 Mgbe ha ruru Betsaida, ụfọdụ mmadụ kpọtaara ya otu onye ìsì rịọọ ya ka o metụ ya aka,
MAR 8:23 Ọ duuru onye ìsì ahụ nʼaka pụọ nʼazụ obodo. Mgbe ahụ, ọ gbụsara ọnụ mmiri nʼanya ya metụkwa ya aka nʼanya. Ọ jụrụ ya sị, “Ị na-ahụ ihe ọbụla?”
MAR 8:24 Nwoke ahụ leliri anya elu ma sị, “Ana m ahụ ndị mmadụ ma ha dị ka osisi na-agagharị agagharị.”
MAR 8:25 Nke ugboro abụọ Jisọs metụkwara ya aka nʼanya, mgbe ahụ anya ya meghere. O bidoro ịhụ ihe niile nke ọma.
MAR 8:26 Ọ zilagara ya ụlọ ya sị ya, “Abanyekwala nʼime obodo.”
MAR 8:27 Mgbe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nʼobodo nta ndị ọzọ dị gburugburu Sizaria Filipai. Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?”
MAR 8:28 Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọkwa sị na ị bụ Ịlaịja maọbụ otu nʼime ndị amụma.”
MAR 8:29 Ma ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst ahụ.”
MAR 8:30 Ọ dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọbụla ihe banyere ya.
MAR 8:31 Emesịa, o bidoro izi ha ihe na Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche, ndị okenye, na ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya, na aghaghị igbu ya, ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe ụbọchị nke atọ gasịrị.
MAR 8:32 Ọ gwaghere ha ihe ndị a ọnụ. Ma Pita kpọọrọ ya pụọ nʼotu akụkụ, bido ịbara ya mba.
MAR 8:33 Ma ọ tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya, baara Pita mba sị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ ekwensu! Ihe ị na-eche echiche ya abụghị uche Chineke, ha bụ echiche mmadụ.”
MAR 8:34 Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ ahụ. Ọ gwara ha sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ, ya buru obe ya soro m nʼazụ.
MAR 8:35 Nʼihi na onye na-azọ ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla gụrụ ndụ ya dị ka ihe furu efu nʼihi m, na nʼihi oziọma m, ga-azọpụta ya.
MAR 8:36 Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, iritecha ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ha?
MAR 8:37 Ọ dị ihe ọzọ dị nʼụwa mmadụ nwere ike iji gbanwere ndụ ya?
MAR 8:38 Ọ bụrụ na ihere na-eme onye ọbụla nʼihi m na nʼihi okwu m nʼụwa ọjọọ a, na nʼụwa mmehie a, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke Mmadụ, mgbe ọ ga-abịaghachi nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”
MAR 9:1 Ma ọ gwara ha sị, “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a, agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke mgbe ọ ga-abịa nʼike.”
MAR 9:2 Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn, duru ha rigoro nʼelu ugwu dị elu. Nʼebe ahụ ka ha nọdụrụ naanị ha. Nʼebe ahụ, a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha.
MAR 9:3 Uwe ya na-enwu ọcha karịa ụdị ọcha ọbụla anya hụrụla. Ọ dịkwa ọcha karịa nke onye ọbụla nʼụwa nwere ike ime ka ihe dị ọcha.
MAR 9:4 Ha hụrụ Ịlaịja na Mosis ka ha pụtara soro Jisọs na-ekwu okwu.
MAR 9:5 Pita gwara Jisọs sị, “Onye ozizi, ọ dị mma ka anyị nọdụ nʼebe a. Ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ. Otu ga-abụ nke gị, otu a bụrụ nke Mosis, nke ọzọkwa a bụrụ nke Ịlaịja.”
MAR 9:6 (Ọ makwaghị ihe ọ ga-ekwu nʼihi na oke egwu tụrụ ha.)
MAR 9:7 Mgbe ahụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Geenụ ya ntị.”
MAR 9:8 Na mberede, mgbe ha lere anya gburugburu, ọ dịkwaghị onye ọzọ ha hụrụ, karịa naanị Jisọs.
MAR 9:9 Mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe ha hụrụ, tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie.
MAR 9:10 Ha zobere ihe a nʼetiti onwe ha, na-ekwurịtara okwu na-atule ihe isi nʼọnwụ bilie pụtara.
MAR 9:11 Ma ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu jiri sị na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”
MAR 9:12 Ọ gwara ha sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa, na-emekwa ka ihe dị ka ọ dị na mbụ. Ma gịnị mere e jiri dee na Nwa nke Mmadụ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ, bụrụkwa onye a jụrụ ajụ?
MAR 9:13 Ka m gwa unu, Ịlaịja abịalarị. Ma ha mesokwara ya mmeso otu ha chọrọ dị ka e dere banyere ya.”
MAR 9:14 Mgbe ha bịarutere nʼebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, ha hụrụ oke igwe mmadụ ka ha gbara ha gburugburu, hụkwa ụfọdụ ndị ozizi iwu ka ha na ha na-arụrịta ụka.
MAR 9:15 Ngwangwa, mmadụ ahụ niile hụrụ ya, ụdịdị ya juru ha anya. Ha gbaara ọsọ gaa kelee ya.
MAR 9:16 Ọ jụrụ ha sị, “Unu na ha ọ na-arụrịta ụka banyere gịnị?”
MAR 9:17 Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, “Onye ozizi akpọtaara m gị nwa m nwoke, nke mmụọ ọjọọ bi nʼime ya, nke mekwara ka ọ daa ogbi.
MAR 9:18 Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ malitere isogbu ya, ọ na-atụda ya nʼala. Mgbe ahụ, ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ ya, na-ata ikikere eze, anụ ahụ ya na-esikwa ike. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ a, ma ha enweghị ike.”
MAR 9:19 Ọ zaghachiri ha sị, “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anagide unu? Kpọtaranụ m ya!”
MAR 9:20 Ya mere, ha kpọtaara ya nwata ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ ya, ngwangwa, o nugharịrị nwata ahụ nke ukwuu, ọ daa nʼala na-atụrụ onwe ya nʼala, na-agbọkwa ụfụfụ nʼọnụ ya.
MAR 9:21 Jisọs jụrụ nna nwata ahụ sị, “Olee mgbe ihe a bidoro?” Ọ zara sị, “Site na mgbe ọ bụ nwata nta.
MAR 9:22 Ọ na-eme ya ka ọ daba nʼọkụ, maọbụ na mmiri, ka ọ laa ya nʼiyi. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka.”
MAR 9:23 Jisọs sịrị ya, “ ‘Ọ bụrụ na i nwere ike’? Ihe niile pụrụ ime nʼebe onye kwere ekwe nọ.”
MAR 9:24 Ngwangwa, nna nwata ahụ tiri mkpu sị, “Ekweere m, biko nyere ekweghị ekwe m aka!”
MAR 9:25 Mgbe Jisọs hụrụ na igwe mmadụ na-agba ọsọ na-abịa nʼebe ahụ, ọ baara mmụọ ahụ na-adịghị ọcha mba sị, “Gị mmụọ ọjọọ ntị ike na ịda ogbi, ana m enye gị iwu, site nʼime nwata a pụta! Abanyekwala nʼime ya ọzọ!”
MAR 9:26 O tiri mkpu nʼoke olu, nugharịa nwata ahụ nke ukwuu ma site nʼime ya pụta. Nwata ahụ tọgbọrọ nʼala dị ka onye nwụrụ anwụ nke mere na ndị niile nọ nʼebe ahụ sịrị, “Ọ nwụọla!”
MAR 9:27 Ma Jisọs jidere ya nʼaka selite ya elu, mee ka o guzo nʼụkwụ ya. O guzokwara.
MAR 9:28 Ma mgbe ọ banyere nʼime ụlọ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya na nzuzo sị, “Gịnị mere o jiri siere anyị ike ịchụpụ ya?”
MAR 9:29 Ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị site nʼike ekpere ka a pụrụ ịchụpụ ụdị a.”
MAR 9:30 Ha siri nʼebe ahụ pụọ gafee Galili. Ọ chọghị ka onye ọbụla mata maka ya,
MAR 9:31 nʼihi na ọ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ sịrị ha, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ, ha ga-egbukwa ya ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe mkpụrụ ụbọchị atọ gasịrị.”
MAR 9:32 Ma ha aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha. Egwu tụkwara ha ị jụ banyere ya.
MAR 9:33 Emesịa, ha bịaruru Kapanọm. Mgbe ọ banyere nʼụlọ, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka banyere ya nʼokporoụzọ?”
MAR 9:34 Ma ha gbara nkịtị, nʼihi na ha rụrịtara ụka nʼokporoụzọ banyere onye dị ukwuu karịa ibe ya.
MAR 9:35 Ọ nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ, sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ghaghị ịbụ onye ikpeazụ, bụrụkwa onye na-ejere mmadụ niile ozi.”
MAR 9:36 Mgbe ahụ o kuuru otu nwantakịrị mee ka o guzoro nʼetiti ha. O kuuru nwata ahụ nʼaka ya sị ha,
MAR 9:37 “Onye ọbụla nabatara otu nʼime ụmụntakịrị ndị a nʼaha m, na-anabata m. Ma onye ọbụla nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ na-anabata onye zitere m.”
MAR 9:38 Jọn sịrị ya, “Onye ozizi, anyị hụrụ otu onye na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼaha gị, ma anyị gbalịrị igbochi ya nʼihi na ọ bụghị otu onye nʼime anyị.”
MAR 9:39 Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu egbochila ya, nʼihi na onye ọbụla ji aha m na-arụ ọrụ ebube agaghị ekwu okwu ọjọọ megide m.
MAR 9:40 Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị.
MAR 9:41 Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nʼaha m, nʼihi na unu bụ ndị nke Kraịst, ga-anatakwa ụgwọ ọrụ ya.
MAR 9:42 “Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri.
MAR 9:43 Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ;
MAR 9:44 ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
MAR 9:45 Ọ bụrụ na ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya, tufukwaa ya, nʼihi na ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwụrọ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ;
MAR 9:46 ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
MAR 9:47 Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa nʼalaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ,
MAR 9:48 ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
MAR 9:49 A ga-eji ọkụ nụchaa onye ọbụla dị ka nnu.
MAR 9:50 “Nnu dị mma, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọkwa ụtọ, olee ka ị ga-esi mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ya mere, nweenụ nnu nʼime onwe unu. Unu na ibe unu biri nʼudo.”
MAR 10:1 Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼobodo ndị dị na mpaghara Judịa ma gafeekwa nʼofe Jọdan. Igwe mmadụ bịakwutekwara ya, ọzọ, dị ka o si emekwa, o ziri ha ihe.
MAR 10:2 Ụfọdụ ndị Farisii bịara, ma nʼihi ị nwalee ya, ha jụrụ ya sị, “O ziri ezi nʼiwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m?”
MAR 10:3 Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere unu nʼiwu?”
MAR 10:4 Ha sịrị, “Mosis kwenyere ka nwoke dee asambodo alụkwaghị m, nye nwunye ya ma zilaga ya.”
MAR 10:5 Jisọs sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na obi unu siri ike nke ukwuu ka o ji deere unu iwu a.
MAR 10:6 Ma na mmalite nke okike ụwa, Chineke ‘kere ha nwoke na nwanyị.’
MAR 10:7 ‘Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya.
MAR 10:8 Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.’Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ.
MAR 10:9 Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”
MAR 10:10 Mgbe ha banyere nʼụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a.
MAR 10:11 Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko megide ya.
MAR 10:12 Ma ọ bụrụ na nwanyị ọbụla agbaa dị ya alụkwaghị m ma lụrụ nwoke ọzọ, ọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.”
MAR 10:13 Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o metụ ha aka, ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba.
MAR 10:14 Ma mgbe Jisọs hụrụ nke a, iwe were ya nke ukwuu, ọ sịrị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a.
MAR 10:15 Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla nke na-agaghị anabata alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.”
MAR 10:16 Mgbe ahụ, o kuuru ha nʼaka ya, bikwasị ha aka ya abụọ ma gọzie ha.
MAR 10:17 Mgbe ọ na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere nʼihu ya. Ọ jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi ọma, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?”
MAR 10:18 Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke.
MAR 10:19 Ị maara ihe niile enyere nʼiwu: ‘Egbula mmadụ, a kwala iko, e zula ohi, a gbala ama ụgha, a ghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nne na nna gị.’”
MAR 10:20 Ọ sịrị ya, “E, onye ozizi, Edebezuchaala m ha niile siterị na mgbe m bụ nwata.”
MAR 10:21 Jisọs lere ya anya, hụ ya nʼanya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ọ fọdụrụ naanị otu ihe ị ga-eme. Laa, ugbu a, ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. I mesịa nke a, ị ga-enwe akụ nʼeluigwe. Mgbe ahụ bịaghachi soro m.”
MAR 10:22 Mgbe ọ nụrụ okwu a, ihu ya gbarụrụ. O sitere nʼebe ahụ pụọ na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya nke nwere ọtụtụ akụnụba.
MAR 10:23 Jisọs legharịrị anya gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe rara ahụ na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze Chineke.”
MAR 10:24 Okwu ya tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya, ma Jisọs gwakwara ha ọzọ sị, “Ụmụntakịrị, ọ bụ nnọọ ihe rara ahụ ịbanye nʼalaeze Chineke.
MAR 10:25 Ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee, karịa onye ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.”
MAR 10:26 Okwu a jubigara ha anya oke. Ha jụrịtara ibe ha sị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”
MAR 10:27 Ma Jisọs lere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ, ọ bụ ihe rara ahụ. Ma nʼebe Chineke nọ, ihe niile dị mfe. Ọ dịghị ihe rara Chineke ahụ ime.”
MAR 10:28 Pita malitere ịgwa ya sị, “Anyị ahapụla ihe niile soro gị!”
MAR 10:29 Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ dịghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ ụmụnne ya ndị nwoke, maọbụ ụmụnne ya ndị nwanyị, maọbụ nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, maọbụ ala ubi ya nʼihi m, na nʼihi oziọma a,
MAR 10:30 nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ.
MAR 10:31 Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ọtụtụ ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.”
MAR 10:32 Ha nọ nʼụzọ na-aga Jerusalem, ma Jisọs nọ nʼihu ha, nke a juru ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Otu a kwa, ndị mmadụ niile na-abịa ha nʼazụ tụkwara egwu. Ọzọkwa, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ nʼakụkụ, malite ịgwa ha ihe gaje ịdakwasị ya.
MAR 10:33 Ọ sịrị, “Leenụ, anyị na-aga Jerusalem, ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ.
MAR 10:34 Ha ga-akwa ya emo, gbụsakwa ya ọnụ mmiri asụ, pịa ya ihe ma gbukwaa ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie.”
MAR 10:35 Jemis na Jọn ụmụ Zebedi bịakwutere ya. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i meere anyị ihe ọbụla anyị rịọrọ.”
MAR 10:36 Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”
MAR 10:37 Ha sịrị ya, “Kwere ka otu onye nʼime anyị nọrọ nʼaka nri gị, onye nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼime ebube gị.”
MAR 10:38 Ma Jisọs sịrị ha, “Unu amataghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ mụ onwe m ga-aṅụ maọbụ bụrụ ndị a ga-eme ụdị baptizim a ga-eme m?”
MAR 10:39 Ha zaghachiri ya, “Anyị pụrụ.” Jisọs sịrị ha, “Unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, a ga-emekwa unu baptizim nke a ga-eme m.
MAR 10:40 Ma ịnọdụ nʼaka nri m maọbụ nʼaka ekpe m abụghị ihe dịrị m inye, kama ọnọdụ ndị a dịịrị ndị a kwadooro ha.”
MAR 10:41 Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nụrụ nke a, iwe jupụtara ha obi nʼihi Jemis na Jọn.
MAR 10:42 Ma Jisọs kpọkọtara ha niile sị ha, “Dị ka unu onwe unu maara, ndị eze nke ndị mba ọzọ, na ndị a maara aha ha, na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha.
MAR 10:43 Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama onye ọbụla chọrọ ịdị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.
MAR 10:44 Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu, ga-abụ ohu mmadụ niile.
MAR 10:45 Nʼihi na Nwa nke Mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi. Kama ka o jee ozi ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”
MAR 10:46 Mgbe ha ruru Jeriko, dị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ sitere nʼobodo Jeriko na-apụ, otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs (aha ya pụtara “nwa nwoke Timiọs”), onye arịrịọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ.
MAR 10:47 Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, “Jisọs, nwa Devid, meere m ebere!”
MAR 10:48 Ọtụtụ mmadụ bara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma ọ nọgidesịrị ike na-eti mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere m ebere!”
MAR 10:49 Jisọs kwụsịrị kwuo sị, “Kpọọnụ ya.” Ya mere ha kpọrọ onye ìsì ahụ, sị ya, “Mesaa ihu gị bilie nʼụkwụ gị, ọ na-akpọ gị.”
MAR 10:50 Ọ tufuru uwe mwụda ya, wulie nʼụkwụ ya, bịakwute Jisọs.
MAR 10:51 Jisọs sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Onye ìsì ahụ sịrị ya, “Onye ozizi m, achọrọ m ka m hụ ụzọ.”
MAR 10:52 Jisọs sịrị ya, “Laa, okwukwe gị azọpụtala gị.” Nʼotu oge ahụ, o bidoro ịhụ ụzọ, sorokwa ya gawa nʼụzọ ahụ.
MAR 11:1 Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji na Betani nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya.
MAR 11:2 Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime obodo nta dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kedoro nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-arịkwasịbeghị nʼelu ya. Tọpụnụ ya nʼagbụ, kpụtaranụ m ya.
MAR 11:3 Ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Gịnị mere unu ji na-atọpụ ya nʼagbụ?’ sịnụ onye ahụ, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ya ngwangwa.’ ”
MAR 11:4 Ha ruru ma hụ otu nwa ịnyịnya e kedoro nʼakụkụ ụzọ, nʼihu otu ụlọ nke dị nʼama. Dị ka ha na-atọpụ ya,
MAR 11:5 ụfọdụ mmadụ guzo nʼebe ahụ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-eme, unu na-atọpụ nwa ịnyịnya a?”
MAR 11:6 Ha gwara ha ihe Jisọs kwuru, ha hapụkwara ha ka ha tọrọ ịnyịnya ibu ahụ.
MAR 11:7 Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, ma wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, ọ nọkwasịrị nʼelu ya.
MAR 11:8 Ọtụtụ mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ, ma ndị ọzọ tụsara alaka osisi ha gbutere nʼọhịa.
MAR 11:9 Ndị na-aga nʼihu na ndị na-esokwa nʼazụ, tiri mkpu na-asị, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!”
MAR 11:10 “Ngọzị dịrị alaeze ahụ na-abịa nke nna anyị Devid!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”
MAR 11:11 Mgbe ọ batara na Jerusalem, ọ gara nʼime nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe o legharịchara anya nʼihe niile dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na chi ejiela, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gaa Betani.
MAR 11:12 Nʼechi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ gụrụ ya.
MAR 11:13 Site nʼebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiig nke nwere akwụkwọ ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gagharịrị nʼukwu ya niile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla, naanị akwụkwọ ndụ, nʼihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ.
MAR 11:14 Mgbe ahụ, ọ gwara osisi ahụ sị, “Ka mmadụ ọbụla ghara iri mkpụrụ sitere na gị ruo ebighị ebi.” Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe o kwuru okwu a.
MAR 11:15 Mgbe ha ruru Jerusalem, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu, bido ịchụpụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa nʼebe ahụ. O kpugharịrị tebul ndị na-agbanwe ego, kwatuokwa oche niile nʼọdụ ahịa ndị na-ere nduru.
MAR 11:16 O gbochikwara onye ọbụla iwebata ngwongwo ahịa orire nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ.
MAR 11:17 Ma dị ka ọ na-ezi ha ihe, ọ sịrị, “Ọ bụ na-edeghị ya sị, Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere nye mba niile? Ma unu emeela ya ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.”
MAR 11:18 Mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nụrụ nke a, ha malitere na-achọ ụzọ igbu ya ma ha tụrụ egwu ya nʼihi na ozizi ya juru igwe mmadụ niile ahụ anya.
MAR 11:19 Mgbe uhuruchi bịara, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya siri nʼobodo ahụ pụọ.
MAR 11:20 Nʼisi ụtụtụ echi ya, mgbe ha na-agafe, ha hụrụ na osisi fiig a esitela na mgbọrọgwụ ya kpọnwụọ.
MAR 11:21 Pita chetara ihe merenụ ma sị ya, “Onye ozizi, lee! Osisi fiig ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla!”
MAR 11:22 Jisọs zara ha sị, “Nweenụ okwukwe nʼime Chineke.
MAR 11:23 Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa.
MAR 11:24 Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu.
MAR 11:25 Ma mgbe ọbụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma ọ bụrụ na unu nwere ihe ọbụla megide onye ọbụla, ka Nna unu nke bi nʼeluigwe gbagharakwa unu mmehie unu.
MAR 11:26 Ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbagharakwa unu mmehie unu.”
MAR 11:27 Mgbe ha rutere Jerusalem ọzọ, ọ nọ na-ejegharị nʼime ogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya.
MAR 11:28 Ha sịrị ya, “Olee ikike i ji eme ihe ndị a ị na-eme? Onye nyere gị ikike ime ha?”
MAR 11:29 Jisọs sịrị ha, “Aga m ajụ unu otu ajụjụ, unu zaa m ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a.
MAR 11:30 Baptizim nke Jọn, o sitere nʼeluigwe ka ọ bụ nʼaka mmadụ? Gwanụ m.”
MAR 11:31 Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’
MAR 11:32 Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼaka mmadụ.’ ” (Ha na-atụ egwu ndị mmadụ, nʼihi na ha niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma nʼezie.)
MAR 11:33 Ya mere ha zara Jisọs sị, “Anyị amaghị.” Jisọs zaghachikwara ha sị, “Agakwaghị m agwa unu ụdị ikike m ji na-eme ihe ndị a.”
MAR 12:1 Mgbe ahụ, ọ bidoro ịgwa ndị ahụ okwu nʼilu sị, “Otu nwoke kụrụ mkpụrụ vaịnị nʼubi ya, jiri mgbidi gbaa ubi ahụ gburugburu. O gwuru ebe ịnara mmanya si na mkpụrụ vaịnị, wuokwa ụlọ elu. Mgbe o mesịrị, o nyefere ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọrụ ubi ilekọta ya ma gaa obodo ọzọ.
MAR 12:2 Mgbe oge ịghọ mkpụrụ ruru, o zipụrụ otu onye ohu ya ka o jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata ha ụfọdụ nʼime mkpụrụ vaịnị ahụ.
MAR 12:3 Ma ha jidere ya tie ya ihe, zilaga ya nʼaka efu.
MAR 12:4 Emesịkwa, o zigakwara onye ohu ọzọ. Ma ha tiwara ya isi, mee ya ihe ihere.
MAR 12:5 O zigakwara onye ọzọ, ma ha gburu ya. O zigakwara ọtụtụ ndị ozi, ma ha gburu ụfọdụ, tie ndị ọzọ ihe.
MAR 12:6 “O nwere naanị otu onye ọzọ fọdụrụ nke ọ ga-eziga, nke bụ ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya. Nʼikpeazụ o zigara ya, buru nʼuche na ha ga-asọpụrụ ọkpara ya.
MAR 12:7 “Ma ndị na-elekọta ubi ahụ sịrịtara onwe ha, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’
MAR 12:8 Ha jidere ya gbuo ya, tufee ozu ya nʼazụ mgbidi ubi vaịnị ahụ.
MAR 12:9 “Gịnị ka unu chere onyenwe ubi vaịnị ahụ ga-eme? Ọ ga-abịa laa ndị ajọ mmadụ ahụ nʼiyi. Ọ ga-enyefekwa ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọzọ.
MAR 12:10 Ọ bụ na unu agụbeghị akwụkwọ nsọ a na-asị, “ ‘Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ abụrụla nkume isi ntọala ụlọ.
MAR 12:11 Ọ bụ Onyenwe anyị rụrụ nke a, ọ dịkwa ịtụnanya nʼanya anyị’?”
MAR 12:12 Mgbe ahụ ndịisi nchụaja, ndị nkuzi iwu na ndị okenye chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼihi na ha matara na ilu ahụ ọ tụrụ megidere ha. Ma ha tụrụ egwu igwe ndị mmadụ ahụ, ya mere ha hapụrụ ya pụọ.
MAR 12:13 Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ site nʼotu ndị Farisii na ndị otu Herọd, ile ma ha ga-esite nʼokwu ọnụ ya jide ya.
MAR 12:14 Ha bịakwutere ya, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye eziokwu, ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ, kama ị na-ezi ụzọ Chineke nʼụzọ eziokwu. O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza ka ọ bụ na o zighị ezi?
MAR 12:15 Anyị kwesiri ịkwụ ya ka ọ bụ anyị ekwesighị?” Ma ebe ọ maara ihu abụọ ha, ya mere ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? Wetaranụ m otu mkpụrụ ego ka m lee ya anya.”
MAR 12:16 Ha wepụtara otu mkpụrụ ego, Ọ sịrị, “Onye nwe onyinyo a? Aha onye ka e bikwasịrị nʼego a?” Ha zara sị, “Ọ bụ nke Siza.”
MAR 12:17 Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nyenụ Siza ihe bụ nke ya, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke ya.” Ọsịsa ya jụkwara ha anya.
MAR 12:18 Ụfọdụ ndị Sadusii bụ ndị sịrị na mbilite nʼọnwụ adịghị bịakwutere ya jụọ ya sị,
MAR 12:19 “Onye ozizi, Mosis nyere anyị iwu na ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, na nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwunye nwoke ahụ, mụta ụmụ nʼaha nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ.
MAR 12:20 Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, nke mbụ lụrụ nwunye ma ọ nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ọbụla.
MAR 12:21 Nke abụọ lụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ma ya onwe ya nwụkwara na-amụtaghị nwa.
MAR 12:22 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha asaa mụtara nwa ọbụla, nʼikpeazụ nwanyị ahụ nwụkwara.
MAR 12:23 Nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka ọ ga-abụ, ebe ụmụnne asaa ndị a lụtụchara ya?”
MAR 12:24 Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu adịghị ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, maọbụ ike Chineke?
MAR 12:25 Mgbe ha ga-esite nʼọnwụ bilie, ọlụlụ di na nwunye agaghị a dị; kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe.
MAR 12:26 Ma nʼokwu banyere ndị nwụrụ anwụ isite nʼọnwụ bilie, ọ bụ na unu agụtabeghị nʼakwụkwọ Mosis ebe e dere maka ọhịa ahụ na-ere ọkụ, na otu Chineke si gwa ya, Abụ m Chineke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.
MAR 12:27 Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ kama nke ndị dị ndụ. Nʼebe ahụ ka unu dahiere nke ukwuu.”
MAR 12:28 Otu nʼime ndị ozizi iwu bịara nʼoge ahụ ha na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na o nyere ha ezi ọsịsa, ọ jụrụ ya sị, “Nʼime iwu niile olee nke kachasị mkpa?”
MAR 12:29 Jisọs zara ya sị, “Nke kachasị mkpa bụ nke a, ‘Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu.
MAR 12:30 Were obi gị niile na mkpụrụobi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya.’
MAR 12:31 Nke abụọ ya bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’Ọ dịghị iwu ọzọ dị nke karịrị ndị a.”
MAR 12:32 Onye ode akwụkwọ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, nʼezie, ị zara nke ọma na Chineke bụ otu, na enweghịkwa chi ọzọ dị karịa ya.
MAR 12:33 Ịhụ ya nʼanya site nʼiji obi gị niile, na nghọta gị niile, nakwa iji ike gị niile, nʼịhụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị, kachasị onyinye aja nsure ọkụ na ịchụ aja niile.”
MAR 12:34 Mgbe Jisọs hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Site na mgbe ahụ ọ dịkwaghị onye ọbụla nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.
MAR 12:35 Mgbe Jisọs nọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ, ọ kwuru sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji sị na Kraịst bụ nwa Devid?
MAR 12:36 Devid nʼonwe ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ kwuo sị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’
MAR 12:37 Devid nʼonwe ya kpọrọ ya Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ o si bụrụ nwa ya?” Igwe mmadụ ahụ jiri obi ụtọ na-ege ya ntị.
MAR 12:38 Dịka ọ na-ezi ihe, ọ siri, “Lezienụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ.Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, na ịnara ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa.
MAR 12:39 Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla.
MAR 12:40 Ha na-eripịa ihe niile dị nʼụlọ ndị inyom ndị di ha nwụrụ anwụ, nʼekpe ogologo ekpere ka a hụta ha. Ndị dị otu a ka a ga-ata ahụhụ dị ukwuu.”
MAR 12:41 Ọ nọdụrụ ala na ncherita ihu ebe igbe onyinye dị, sị ebe ahụ na-ahụ otu igwe mmadụ ahụ si etinye ego ha nʼime igbe onyinye. Ọtụtụ ndị ọgaranya tụnyere ego buru ibu.
MAR 12:42 Otu nwanyị bụ ogbenye, nke di ya nwụrụ anwụ, bịara tinye mkpụrụ ego ọla abụọ nke pụtara otu peni.
MAR 12:43 Ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nʼezie agwa m unu, nwanyị a di ya nwụrụ anwụ, bụkwa ogbenye, etinyela ego nʼime igbe onyinye a karịa ndị ọzọ.
MAR 12:44 Nʼihi na ndị ọzọ sitere nʼịba ụba nke ego ha nwere tinye, ma nwanyị a sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o nwere, ọ bụladị ihe niile o ji biri.”
MAR 13:1 Mgbe o sitere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-apụ, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya siri ya, “Onye ozizi, ị hụkwara otu ụlọ a si maa mma. Lee ụdị nkume buru ibu e ji wuo ha.”
MAR 13:2 Jisọs zara ha, “Ị hụrụ ụlọ ukwu ndị a? Oge na-abịa mgbe ọ na-adịghị nkume ga-atụkwasị nʼelu ibe ya, nʼihi na a ga-ala ha niile nʼiyi.”
MAR 13:3 Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, na ncherita ihu ụlọnsọ ukwu, Pita na Jemis, na Jọn na Andru bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị,
MAR 13:4 “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama izi na o ruola mgbe ha niile ga-emezu?”
MAR 13:5 Jisọs malitere ịgwa ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu.
MAR 13:6 Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ.
MAR 13:7 Mgbe unu nụrụ maka agha na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu. Ihe ndị a aghaghị ime ma oge ọgwụgwụ ihe niile erubeghị.
MAR 13:8 Mba ga-ebili megide mba ibe ya. Alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ibe ya. Ala ọma jijiji na ụnwụ ga-adị nʼebe dị iche iche. Ihe ndị a bụ mmalite nke oke ihe mgbu.
MAR 13:9 “Unu aghaghị ịbụ ndị nọ na nche. A ga-enyefe unu nʼaka ndị na-achị achị, pịakwa unu ihe nʼụlọ ekpere. Nʼihi m, unu ga-eguzo nʼihu ndịisi ọchịchị na ndị eze dị ka ndị ama nye ha.
MAR 13:10 Aghaghị ibu ụzọ kwusaa oziọma a nye mba niile.
MAR 13:11 Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nʼụlọikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, kwuonụ naanị ihe batara unu nʼọnụ unu ikwu nʼoge ahụ. Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu.
MAR 13:12 “Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya. Nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha.
MAR 13:13 Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m, ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
MAR 13:14 “Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi ka ọ na-eguzo nʼebe ọ na-ekwesighị(onye na-agụ ya nwee nghọta), mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu
MAR 13:15 Onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ ya ghara ịrịdata maọbụ baa nʼime ụlọ ya iwepụta ihe ọbụla.
MAR 13:16 Ka onye ọbụla nọ nʼubi ghara ịlọghachi ịchịrị uwe ya.
MAR 13:17 Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ.
MAR 13:18 Kpeenụ ekpere ka ihe ndị a hapụ ime nʼoge oke oyi.
MAR 13:19 Nʼihi na oke mkpagbu nke ụbọchị ahụ ga-abụ nke na-adịbeghị na mbụ site na mgbe Chineke kere ụwa ruo ugbu a. Ọ dịkwaghị ihe ga-adịkwa ka ya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
MAR 13:20 “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, ọ dịghị onye a ga-azọpụta. Ma nʼihi ndị ya, ndị ọ họpụtara, o meela ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ.
MAR 13:21 Nʼoge ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee, ọ nọ nʼebe ahụ,’ unu ekwela.
MAR 13:22 Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha, ga-apụta ma rụọkwa ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị iche iche iji duhie ndị a họpụtara ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.
MAR 13:23 Ya mere, unu nọrọ na nche; nʼihi na agwala m unu ihe niile mgbe ha na-emebeghị.
MAR 13:24 “Nʼụbọchị ndị ahụ, nke na-esote oge mkpagbu ahụ, “ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya;
MAR 13:25 kpakpando ga-esi na mbara eluigwe na-ada, ike niile dị na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.’
MAR 13:26 “Nʼoge ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ, ka ọ na-abịa nʼigwe ojii nʼoke ike na ebube.
MAR 13:27 Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha kpokọta ndị a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke ụwa. Site na nsọtụ niile nke ụwa ruo na nsọtụ niile nke eluigwe.
MAR 13:28 “Ugbu a, mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya dị nro malite iwepụta akwụkwọ ndụ, unu maara na ọkọchị dị nso.
MAR 13:29 Nʼụzọ dị otu a, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha bidoro ime, matanụ na ọ nọ nso, ọ nọkwa nʼọnụ ụzọ.
MAR 13:30 Ana m agwa unu eziokwu na ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo.
MAR 13:31 Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide.
MAR 13:32 “Ma banyere ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ, o nweghị onye ọbụla maara, ọ bụladị ndị mmụọ ozi nke eluigwe, maọbụ Ọkpara ahụ, kama naanị Nna ahụ maara ya.
MAR 13:33 Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọrọnụ na nche! Mụrụkwanụ anya!
MAR 13:34 Ọ dị ka nwoke hapụrụ ụlọ ya na-aga njem, tinye nʼaka ndị ohu ya ilekọta ihe, onye ọbụla nʼime ha ka o nyere ọrụ ọ ga-arụ ma nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọ na nche.
MAR 13:35 “Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ.
MAR 13:36 Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nʼụra.
MAR 13:37 Ihe m gwara unu ka m na-agwakwa mmadụ niile. ‘Nọrọnụ na nche.’ ”
MAR 14:1 Abalị abụọ tupu e mee Mmemme Ngabiga na mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ aghụghọ ha ga-esi jide Jisọs gbuo ya.
MAR 14:2 Ma ha kwuru sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme a, ka ọgbaaghara ghara ịdị.”
MAR 14:3 Ka ọ nọdụrụ nʼoche nri na Betani nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, otu nwanyị bu karama alabasta mmanụ otite dị oke ọnụahịa, nke e jiri ezigbo naad mee, batara. Ọ kụwara karama ahụ, wụsa ya mmanụ otite ahụ nʼisi.
MAR 14:4 Ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ were iwe nke ukwuu. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị mere e jiri laa mmanụ otite nke a nʼiyi otu a?
MAR 14:5 A gaara ere mmanụ otite a ihe karịrị narị denarị atọ, were ego e retara ya nye ndị ogbenye.” Ha baara ya mba nʼolu ike.
MAR 14:6 Ma Jisọs sịrị, “Hapụnụ ya aka. Gịnị mere unu ji esogbu ya? Ọ bụ ezi ọrụ ka ọ rụrụ nʼebe m nọ.
MAR 14:7 Unu na ndị ogbenye na-anọ oge niile, unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọbụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya.
MAR 14:8 O mere ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ otite a ugbu a iji kwado ahụ m maka olili a ga-eli ya.
MAR 14:9 Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla a ga-ekwusa oziọma a nʼụwa niile, ọrụ a ọ rụrụ ka a ga-akọkwa akụkọ ya, iji cheta ihe ọma a o mere.”
MAR 14:10 Mgbe ahụ Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ jekwuuru ndịisi nchụaja ịgba izu otu ọ ga-esi rara ya nye ha nʼaka.
MAR 14:11 Mgbe ha nụrụ nke a, ha ṅụrịrị ọṅụ kwee ya nkwa inye ya ego. Site nʼụbọchị ahụ, o bidoro ịchọgharị ụzọ ọ ga-esi rara ya nye ha.
MAR 14:12 Nʼụbọchị mbụ nke Mmemme achịcha na-ekoghị eko, mgbe ha na-achụ aja atụrụ ngabiga, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe, maka oriri ngabiga?”
MAR 14:13 O zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Gaanụ nʼime obodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya.
MAR 14:14 Ebe ọbụla ọ banyere, sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ọbịa a kwadoro m, ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri ngabiga?
MAR 14:15 Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu nʼelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe niile. Kwadoonụ ihe anyị nʼebe ahụ.”
MAR 14:16 Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ baa nʼime obodo, ha hụrụ ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ma kwadokwa nri ngabiga ahụ.
MAR 14:17 Mgbe o ruru uhuruchi, ya na ndị ozi ya iri na abụọ ahụ so bịa.
MAR 14:18 Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, otu onye nʼime unu ga-arara m nye. E, otu onye so m ugbu a na-eri nri!”
MAR 14:19 Ha bidoro inwe obi mwute, na-asị ya nʼotu nʼotu, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?”
MAR 14:20 Ọ sịrị ha, “Ọ bụ otu onye nʼime mmadụ iri na abụọ a. Onye mụ na ya na-amanyekọta aka nʼime otu efere.
MAR 14:21 Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e dere banyere ya. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”
MAR 14:22 Dị ka ha na-eri nri, o weere achịcha, nye ekele, nyawa ya, nye ha sị, “Rienụ ya, nke a bụ ahụ m.”
MAR 14:23 Mgbe ahụ, o buuru iko, nye ekele bunyekwa ha. Ha niile ṅụrụ site nʼotu iko ahụ.
MAR 14:24 Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke a na-awụfu nʼihi ọtụtụ mmadụ.
MAR 14:25 Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, agaghị m aṅụ mmanya vaịnị ọzọ tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe m ga-aṅụ ya ọhụrụ nʼalaeze Chineke.”
MAR 14:26 Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
MAR 14:27 Jisọs sịrị ha, “Unu niile ga-agbahapụ m, nʼihi na e dere ya otu a sị, “ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ ga-agbasasịkwa.’
MAR 14:28 Ma mgbe e mesịrị ka m si nʼọnwụ bilie, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.”
MAR 14:29 Pita kwuru, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị, agaghị m eme otu a.”
MAR 14:30 Jisọs sịrị ya, “Ịgwa gị eziokwu, nʼụbọchị taa, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
MAR 14:31 O kwusịrị ike sị, “Ọ bụrụkwa na ihe ọnwụ adapụta, aga m eso gị nwụọ. Agaghị m agọnarị gị!” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha niile kwuru.
MAR 14:32 Ha pụrụ garuo ebe a na-akpọ Getsameni. Nʼebe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa kpee ekpere.”
MAR 14:33 Ọ kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn tinyere onwe ya. Ọ malitere inwe ihe mwute dị ukwuu nakwa obi ịlọ mmiri.
MAR 14:34 Ọ sịrị ha, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọdụnụ nʼebe a na-eche nche.”
MAR 14:35 Ọ gatụrụ nʼihu daa nʼala kpee ekpere, sị, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ka oge awa ahụ gabiga ya.
MAR 14:36 O kwuru sị, “Abba,Nna, ị pụrụ ime ihe niile. Napụ m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.”
MAR 14:37 Ọ bịara hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Saimọn, ị na-arahụ ụra? Ọ bụ na ị nweghị ike iche nche otu awa?
MAR 14:38 Nọrọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa. Mmụọ dị ike ma anụ ahụ adịghị ike.”
MAR 14:39 Ọ pụkwara ọzọ, gaa kpee ekpere, na-ekwukwa otu okwu ahụ.
MAR 14:40 Mgbe ọ lọghachiri azụ ọ hụrụ na ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ nke ukwuu. Ha amakwaghị ihe ha ga-agwa ya.
MAR 14:41 Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra na-ezukwa ike? O zuola! Oge awa ahụ abịala. Lee, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie.
MAR 14:42 Bilienụ! Ka anyị gawa! Lee, onye na-arara m nye nọ nso.”
MAR 14:43 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ batara, ya na igwe mmadụ, ndị ji mma agha na mkpọ. Ọ bụ ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu, na ndị ode akwụkwọ, na ndị okenye ndị Juu zitere ha.
MAR 14:44 Ma onye na-arara ya nye, nyere ha rịị ihe ịrịbama sị, “Onye ahụ nke m ga-esutu ọnụ bụ ya; jidenụ ya, kpụrụnụ ya gawa, ma jidesiekwanụ ya ike.”
MAR 14:45 Ngwangwa o jekwuuru Jisọs, sị ya, “Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ.
MAR 14:46 Ndị ikom ahụ jidere Jisọs ma sekpụrụ ya nʼike.
MAR 14:47 Ma otu onye nʼime ndị guzo nʼebe ahụ, mịpụtara mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya.
MAR 14:48 Jisọs sịrị ha, “Abụ m onyendu nke ndị na-enupu isi nke mere unu ji were mma agha na mkpọ bịa ijide m?
MAR 14:49 Ụbọchị niile ka mụ na unu nọ mgbe m na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu, ma unu ejideghị m. Ma ihe akwụkwọ nsọ kwuru aghaghị imezu.”
MAR 14:50 Mgbe ahụ, ha niile hapụrụ ya gbalaga.
MAR 14:51 Ọ dị otu nwokorobịa na-eso ya, ọ ji naanị akwa ọcha linin kpuchie onwe ya. Mgbe ha jidere ya,
MAR 14:52 ọ hapụụrụ ha akwa ọcha linin ya, gbara ọtọ gbalaga.
MAR 14:53 Ha duuru Jisọs gakwuru onyeisi nchụaja, ha niile bụ ndịisi nchụaja, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ nʼebe ahụ.
MAR 14:54 Pita sooro ha, ma ọ nọ nʼebe dị anya. O sooro ha bata nʼobi onyeisi nchụaja. Nʼebe ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ.
MAR 14:55 Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara.
MAR 14:56 Ọtụtụ bịara gbaa ama ụgha megide ya, ma ama ha abụghị otu.
MAR 14:57 Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị,
MAR 14:58 “Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’ ”
MAR 14:59 Ọ bụladị na nke a, ama ha niile adakọtakwaghị nʼotu.
MAR 14:60 Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nʼihu ha, jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ama ndị a a na-agba megide gị?”
MAR 14:61 Ma ọ gbakwara nkịtị, ọ zaghị ihe ọbụla. Ọzọkwa, onyeisi nchụaja jụrụ ya sị, “Ị bụ Kraịst, Ọkpara Onye a gọziri agọzi?”
MAR 14:62 Jisọs sịrị, “Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”
MAR 14:63 Onyeisi nchụaja dọwara uwe ya kwuo sị, “Gịnị mere anyị ji achọ ndị akaebe ọzọ?
MAR 14:64 Unu anụla okwu nkwulu si ya nʼọnụ pụta! Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha niile mara ya ikpe sị, “O kwesiri ka ọ nwụọ!”
MAR 14:65 Mgbe ahụ ụfọdụ bidoro ịgbụ ya ọnụ mmiri asọ, jiri akwa kechie ya anya, tiekwa ya aka na-asị, “Buo amụma!” Ndị nche kpụpụtara ya tiekwa ya ihe.
MAR 14:66 Dịka Pita nọ nʼobi ahụ, otu nʼime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịara nso ebe ọ nọ.
MAR 14:67 Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, o leziri ya anya nke ọma, sị, “Ị bụ otu nʼime ndị na-eso Jisọs onye Nazaret ahụ.”
MAR 14:68 Ma ọ gọrọ agọ sị, “Amaghị m, maọbụ ghọtakwa ihe ị na-ekwu.” Ma ọ pụrụ gaa nʼụzọ e si abata. Mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa.
MAR 14:69 Mgbe nwaagbọghọ ahụ hụrụ Pita ọzọ, o gosiri ya ndị ọzọ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Nwoke a bụkwanụ otu nʼime ha.”
MAR 14:70 Ma ọ gọkwara agọ ọzọ. Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo Pita nso sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ otu nʼime ha, nʼihi na ị bụ onye Galili.”
MAR 14:71 Mgbe ahụ o bidoro ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi na-asị, “Amaghị m onye nwoke a unu na-ekwu okwu ya bụ.”
MAR 14:72 Nʼotu oge ahụ, oke ọkụkụ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara okwu Jisọs gwara ya sị, “Tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Obi tiwara ya mee ka ọ kwaa akwa.
MAR 15:1 Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet.
MAR 15:2 Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
MAR 15:3 Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe.
MAR 15:4 Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.”
MAR 15:5 Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya.
MAR 15:6 Ugbu a, ọ bụ omenaala nʼoge mmemme, na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye ha rịọrọ ka a hapụ.
MAR 15:7 Nʼoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị biliri megide isi ọchịchị, ndị gbukwara mmadụ nʼoge ọgbaaghara ahụ.
MAR 15:8 Igwe mmadụ gbakọrọ na-arịọ Pailet ka o mezuoro ha omenaala ha.
MAR 15:9 Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Unu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?”
MAR 15:10 Ebe ọ maara na ọ bụ nʼihi ekworo ka ndịisi nchụaja ji nyefee Jisọs nʼaka ya.
MAR 15:11 Ma ndịisi nchụaja kpaliri igwe mmadụ ahụ ka ha kwagide ya ka ọ hapụrụ ha Barabas.
MAR 15:12 Pailet jụrụ ha ọzọ sị, “Gịnị ka m ga-eme nwoke a unu kpọrọ eze ndị Juu?”
MAR 15:13 Ma ha tiri mkpu ọzọ sị, “Kpọgide ya nʼobe!”
MAR 15:14 Ma Pailet jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe!”
MAR 15:15 Ma ebe Pailet chọrọ ime ihe ga-atọ igwe mmadụ ahụ ụtọ, ọ hapụụrụ ha Barabas, nyefee ha Jisọs nʼaka ka ha pịa ya ihe ma kpọgidekwa ya nʼobe.
MAR 15:16 Ndị agha ahụ duuru ya pụọ baa nʼime ụlọeze a na-akpọ Pritoriọm. Ha kpọkọtakwara ndị agha ndị otu ha ndị ọzọ.
MAR 15:17 Ha yinyere ya uwe mwụda na-acha odo odo, kpukwasịkwa ya okpueze nke e ji ogwu kpaa nʼisi.
MAR 15:18 Emesịa, ha malitere na-ekele ya sị, “Ekele, eze ndị Juu.”
MAR 15:19 Ha ji osisi kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe, na-agbụ ya ọnụ mmiri asọ. Ha gbukwara ikpere nʼihu ya, na-akpọ isiala na-enye ya.
MAR 15:20 Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe odo odo ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya. Emesịa, ha duuru ya pụọ gawa ịkpọgide ya nʼobe.
MAR 15:21 Ha zutere otu onye na-agata nʼụzọ, aha ya bụ Saimọn, onye Sirini, bụ nna Alegzanda na Rufọs. Ha manyere ya ka o buru obe ya.
MAR 15:22 Nʼikpeazụ, ha duuru Jisọs ruo ebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara “ebe okpokoro isi”).
MAR 15:23 Ha nyere ya mmanya a gwara máá, ma ọ jụrụ ịṅụ ya.
MAR 15:24 Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe.
MAR 15:25 Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ.
MAR 15:26 Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ: Eze ndị Juu.
MAR 15:27 Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe, otu nʼaka nri ya, nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
MAR 15:28 A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.
MAR 15:29 Ndị mmadụ si nʼebe ahụ gafee fufere isi ha na-ekwutọ ya, na-asị, “Leenụ gị! Onye ga-akwada ụlọnsọ ma wugharịa ya nʼabalị atọ.
MAR 15:30 Zọpụtanụ onwe gị! Si nʼelu obe ahụ rịdata.”
MAR 15:31 Ọ bụladị ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị ode akwụkwọ nọ na-akwa ya emo nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma ọ pụghị ịzọpụta onwe ya!
MAR 15:32 Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.
MAR 15:33 Mgbe ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nʼelekere atọ nke ehihie.
MAR 15:34 Nʼelekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu akwa nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani!” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”).
MAR 15:35 Ma ụfọdụ ndị guzo nso nʼebe ahụ, mgbe ha nụrụ nke a, sịrị, “Lee, ọ na-akpọ Ịlaịja!”
MAR 15:36 Ya mere, otu onye gbaara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nʼime mmanya gbara ụka, fanye ya na okporo osisi, nye ya ka ọ ṅụọ, ma na-asị, “Hapụnụ ya, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa tọtuo ya.”
MAR 15:37 Ma Jisọs tiri mkpu nʼolu ike, kubie ume.
MAR 15:38 Akwa mgbochi nke ụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ ruo nʼọnụ ala ala ya.
MAR 15:39 Mgbe ọchịagha guzo nʼihu ya, hụrụ otu o si kubie ume, o kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.”
MAR 15:40 O nwere ụfọdụ ụmụ nwanyị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme, nʼetiti ha bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemis nke nta, na Josef, na Salomi.
MAR 15:41 Ndị a bụ ndị naara eso ya na-ejekwara ya ozi, mgbe ọ nọ na Galili. Ọ dịkwa ndị inyom ọzọ nọkwa nʼebe ahụ, bụ ndị sooro ya bịa na Jerusalem.
MAR 15:42 Nʼoge uhuruchi (ya bụ ụbọchị na-abọta ụbọchị izuike), ebe ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe,
MAR 15:43 Josef onye Arimatia, otu nʼime ndị otu nʼụlọ nzukọ, onye a na-asọpụrụ, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke, ji obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o bunye ya ahụ Jisọs.
MAR 15:44 Ọ juru Pailet anya ịnụ na ọ nwụọla. Ọ kpọrọ ọchịagha ahụ jụọ ya ma ọ nwụọla.
MAR 15:45 Mgbe ọchịagha ahụ gwara ya na ọ nwụọla, o kwere ka Josef buru ahụ ya.
MAR 15:46 Josef zụtara akwa ọcha linin, wedata ahụ ya jiri akwa ahụ fụchie ya. O buuru ya buba ya nʼime ili nke o gwuru nʼime nkume. Emesịa o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ụzọ ili ahụ.
MAR 15:47 Meri Magdalin na Meri nne Josef hụkwara ebe e bubara ahụ ya.
MAR 16:1 Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ.
MAR 16:2 Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ.
MAR 16:3 Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?”
MAR 16:4 Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ.
MAR 16:5 Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu.
MAR 16:6 Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya.
MAR 16:7 Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’ ”
MAR 16:8 Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi.
MAR 16:9 Mgbe Jisọs biliri nʼọnwụ nʼisi ụtụtụ nʼụbọchị mbụ nke izu, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, onye ahụ o siri nʼahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa.
MAR 16:10 Ọ lara gaa kọrọ ndị ya na ha na-anọ na mbụ, bụ ndị nọrịị na-ebe akwa ma na-erukwa ụjụ.
MAR 16:11 Mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na ọ hụkwala ya, ha ekweghị.
MAR 16:12 Mgbe ihe ndị a gasịrị, o gosiri mmadụ abụọ nʼime ha onwe ya nʼụdị ọzọ, mgbe ha na-abanye nʼime obodo.
MAR 16:13 Ndị a laghachiri bịa kọọrọ ndị nke ọzọ ma ha ekwetakwaghị.
MAR 16:14 Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ya, mgbe ha nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nʼihi enweghị okwukwe ha nakwa mkpọchi obi ha, nʼihi na ha jụrụ ikwenye nʼihe ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha mgbe e mesịrị ka ọ si nʼọnwụ bilite.
MAR 16:15 Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma.
MAR 16:16 Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara baptizim ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe.
MAR 16:17 Ihe ịrịbama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ. Site nʼaha m, ha ga-achụpụ mmụọ ọjọọ; kwuokwa okwu nʼasụsụ ọhụrụ dị iche iche.
MAR 16:18 Ha ga-eji aka ha abụọ atụtụlie agwọ, ṅụọkwa nsi ma ọ gaghị emerụ ha ahụ ma otu. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, ahụ ga-adịkwa ha mma.”
MAR 16:19 Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe, ebe ọ nọdụ ala nʼakụkụ aka nri Chineke.
MAR 16:20 Ha pụrụ kwusaa oziọma nʼebe niile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha, mee ka okwu ya guzosie ike site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke na-eso ya.
LUK 1:1 Ebe ọ bụ nʼọtụtụ mmadụ agbalịala otu ha nwere ike i detu nʼusoro ihe niile mezuru nʼetiti anyị.
LUK 1:2 Dị ka e nyefere ha nʼaka anyị idebe bụ ndị ahụ sitere na malite jiri anya ha hụ ihe niile, ndị jikwa okwu a eje ozi.
LUK 1:3 Ekpebikwara m, ebe mụ onwe m nyocharala ihe niile nke ọma site na mmalite, ka m dere gị ihe niile nʼusoro, Tiofilọs, gị onye dị elu a na-asọpụrụ.
LUK 1:4 Nke a ga-eme ka ị mata nke bụ eziokwu banyere ihe ndị ahụ e ziri gị.
LUK 1:5 Nʼoge Herọd bụ eze Judịa, ọ dị otu onyeisi nchụaja aha ya bụ Zekaraya, onye si nʼotu ndị nchụaja nke Abija. Elizabet bụ nwunye ya, site nʼagbụrụ Erọn.
LUK 1:6 Ha abụọ bụ ndị ezi omume nʼihu Chineke. Ha debere iwu na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere na-enweghị ntụpọ ọbụla.
LUK 1:7 Mana ha amụtaghị nwa, nʼihi na Elizabet bụ nwanyị agaa, ha abụọ emeela nnọọ agadi.
LUK 1:8 O ruru mgbe ọ bụ ndị otu Zekaraya ga-eje ozi, ọ nọ dịka onye nchụaja na-eje ozi nʼihu Chineke.
LUK 1:9 A họpụtara ya site nʼife nza dị ka omenaala ndị nchụaja si dị ka ọ bụrụ ya ga-abanye nʼime ime ụlọnsọ Onyenwe anyị ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ.
LUK 1:10 Mgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere.
LUK 1:11 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye guzo nʼaka nri nke ebe ịchụ aja nke ihe na-esi isi ụtọ mere ka ọ hụ ya anya.
LUK 1:12 Mgbe Zekaraya hụrụ ya, obi fepụrụ ya, ọ tụkwara oke egwu.
LUK 1:13 Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya sị, “Zekaraya atụla egwu, Chineke anụla ekpere gị. Elizabet nwunye gị ga-atụrụ ime mụtara gị nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jọn.
LUK 1:14 Ọ ga-abụrụ gị ihe oke ọṅụ na obi ụtọ, ọtụtụ mmadụ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ọmụmụ ya.
LUK 1:15 Nʼihi na ọ ga-abụ onye dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gaghị aṅụkwa mmanya ọbụla, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-egbu egbu nʼihi na site nʼafọ nne ya ọ ga-abụ onye emejupụtara na Mmụọ Nsọ.
LUK 1:16 Ọ ga-akpọghachite ọtụtụ ụmụ Izrel nye Onyenwe ha bụ Chineke ha.
LUK 1:17 Ma ọ ga-aga nʼihu Onyenwe anyị nʼike mmụọ na ike nke Ịlaịja, tụgharịa obi ndị bụ nna nʼebe ụmụ ha nọ. Meekwa ka ndị isiike tụgharịa obi, lekwasị anya nʼamamihe nke ndị ezi omume, na ijikere ụmụ mmadụ nʼihi Onyenwe anyị.”
LUK 1:18 Zekaraya sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu m ga-esi mata na nke a ga-adị otu a? Abụrụla m agadi. Nwunye m akakwaala nka.”
LUK 1:19 Mmụọ ozi zara ya sị, “Abụ m Gebrel. Ana m eguzo nʼihu Chineke. Ezitere m ka m bịa gwa gị okwu ma wetara gị oziọma a.
LUK 1:20 Ma lee, ị ga-ada ogbi, ị gaghị ekwukwa okwu ọbụla, tutu ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu nʼihi na i kwenyeghị nʼokwu m, nke ga-emezu mgbe oge ya ruru.”
LUK 1:21 Mgbe ihe ndị a niile na-eme, mmadụ ndị ahụ nọkwa na-eche Zekaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ.
LUK 1:22 Mgbe o mesịrị pụta, o nwekwaghị ike ikwuru ha okwu. Ha ghọtara na ọ hụrụ ọhụ nʼime ụlọnsọ ahụ nʼihi na ọ bụ aka ka o ji gwa ha okwu.
LUK 1:23 Mgbe oge ịrụ ọrụ ya gwụsịrị, ọ laghachiri nʼụlọ ya.
LUK 1:24 Mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, Elizabet bụ nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nʼime ụlọ ọnwa ise.
LUK 1:25 Ọ sịrị, “Onyenwe anyị emeerela m nke a. O gosila m ihuọma ya nʼụbọchị ndị a, ma wepụkwara m ihere nʼetiti ndị nke m.”
LUK 1:26 Ma nʼọnwa isii ya, Chineke zigara mmụọ ozi ya, bụ Gebrel, ka ọ gaa nʼobodo Nazaret nke dị nʼime Galili.
LUK 1:27 Ka o jekwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere nʼagbụrụ Devid, kwere nkwa ịlụ. Aha nwaagbọghọ a bụ Meri.
LUK 1:28 O jekwuru ya sị ya, “Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị.”
LUK 1:29 Ma obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara.
LUK 1:30 Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ.
LUK 1:31 Ma lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs.
LUK 1:32 Ọ ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid.
LUK 1:33 Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.”
LUK 1:34 Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?”
LUK 1:35 Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke.
LUK 1:36 Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga.
LUK 1:37 Nʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.”
LUK 1:38 Meri zaghachiri sị, “Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.
LUK 1:39 Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda.
LUK 1:40 Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet.
LUK 1:41 Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ.
LUK 1:42 O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa.
LUK 1:43 Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m?
LUK 1:44 Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ.
LUK 1:45 Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.”
LUK 1:46 Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu
LUK 1:47 mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m,
LUK 1:48 nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi.
LUK 1:49 Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ.
LUK 1:50 Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
LUK 1:51 O gosila ike aka ya; ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha.
LUK 1:52 O sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu.
LUK 1:53 O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu.
LUK 1:54 O nyerela odibo ya bụ Izrel aka, ọ na-echetakwa imere ya ebere.
LUK 1:55 Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”
LUK 1:56 Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.
LUK 1:57 Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke.
LUK 1:58 Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ.
LUK 1:59 Nʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya,
LUK 1:60 ma Nne ya sịrị, “Mba, a ga-agụ ya Jọn.”
LUK 1:61 Ha sịrị ya, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ndị ikwu gị na-aza aha ahụ.”
LUK 1:62 Ya mere, ha jiri ife aka jụọ nna ya, ihe ọ chọrọ ka akpọ nwata ahụ.
LUK 1:63 Ọ rịọrọ ka e nye ya mbadamba ihe e ji ede ihe, o deere “Aha ya bụ Jọn.” Nke a jukwara mmadụ niile anya.
LUK 1:64 Ngwangwa, ọnụ ya meghere, atọpụkwara ire ya. Ya ebido ikwu okwu ma na-etokwa Chineke.
LUK 1:65 Ibubo wụrụ ndị agbataobi ha niile nʼahụ, ndị mmadụ kọkwara akụkọ banyere ihe ndị a niile ruo obodo niile dị nʼakụkụ ugwu Judịa.
LUK 1:66 Ndị niile nụrụ akụkọ a chere nʼobi ha na-ajụ sị, “Gịnịkwa ka nwa nke a gaje ịbụ?” Nʼihi na aka Onyenwe anyị dịnyeere ya.
LUK 1:67 E mere ka Zekaraya bụ nna ya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma sị,
LUK 1:68 “Ngọzị dịrị Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, nʼihi na ọ bịala leta ma gbapụtakwa ndị nke ya.
LUK 1:69 O welielara anyị Onye nzọpụta site nʼụlọ odibo ya bụ Devid.
LUK 1:70 (Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ).
LUK 1:71 Na ọ ga-azọpụta anyị site nʼaka ndị iro anyị na sitekwa nʼaka ndị niile kpọrọ anyị asị.
LUK 1:72 O meere ndị nna nna anyị ha ebere site nʼicheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ.
LUK 1:73 Iyi nke ọ ṅụụrụ nna anyị bụ Ebraham, kwekwa nkwa:
LUK 1:74 Na ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, nyekwa anyị ike ife ya ofufe na-atụghị egwu.
LUK 1:75 Nʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị.
LUK 1:76 “Ma gị nwa m, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye kachasị ihe niile elu; nʼihi na ị ga-aga nʼihu Onyenwe anyị kwadoro ya ụzọ.
LUK 1:77 Ime ka ndị nke ya nwee amamihe nke nzọpụta site na ịgbaghara mmehie ha.
LUK 1:78 Nʼihi oke obi ebere Chineke anyị, nke ọwụwa anyanwụ ga-ewetara anyị site nʼigwe.
LUK 1:79 Ka ọ chakwasị ndị bi nʼọchịchịrị na nʼonyinyo nke ọnwụ, na iduzi ụkwụ anyị nʼụzọ nke udo.”
LUK 1:80 Nwata ahụ toro, bụrụ onye dị ike nʼime mmụọ. O biri nʼime ọzara tutu ruo mgbe oge zuru igosi ụmụ Izrel onwe ya.
LUK 2:1 Nʼoge ahụ, Siza Ọgọstọs nyere iwu ka a gụọ ọnụ, detuo aha mmadụ niile bi nʼụwa dum.
LUK 2:2 (Nke a bụ ịgụ ọnụ na ide aha nke mbụ e mere mgbe Kwirinus bụ onye na-achị Siria.)
LUK 2:3 Onye ọbụla gara nʼobodo ya, ka e denye aha ya nʼakwụkwọ.
LUK 2:4 Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta.
LUK 2:5 Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha.
LUK 2:6 Mgbe ha nọ ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ya zuru.
LUK 2:7 Ọ mụrụ nwa nwoke mbụ ya. O ji akwa kee ya, nibe ya nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri, nʼihi na ha enwetaghị ebe ndina nʼụlọ ndị ije.
LUK 2:8 Ma e nwere ndị ọzụzụ atụrụ bi nʼọhịa nʼakụkụ ebe ahụ, ndị na-eche igwe atụrụ ha nche nʼabalị.
LUK 2:9 Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtara ihe nye ha. Ebube Onyenwe anyị mụwara gburugburu ha, oke egwu tụrụ ha.
LUK 2:10 Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ana m ewetara unu oziọma nke oke ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ niile.
LUK 2:11 Nʼihi na taa, nʼobodo Devid ka a mụrụ Onye nzọpụta nye unu; ọ bụ Kraịst, Onyenwe anyị.
LUK 2:12 Nke a ga-abụrụ unu ihe ịrịbama, unu ga-ahụ nwata ọhụrụ e kechiri nʼakwa, dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri.”
LUK 2:13 Na mberede, igwe ndị mmụọ ozi nke eluigwe pụtara soro mmụọ ozi a, bido na-eto Chineke na-asị,
LUK 2:14 “Otuto dịrị Chineke nʼebe kachasị elu nke eluigwe. Udo nʼelu ụwa nye ndị niile ihe ha dị Chineke ezi mma.”
LUK 2:15 Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ha, laghachi nʼeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betlehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a merenụ, nke Onyenwe anyị mere ka anyị mara.”
LUK 2:16 Ha gara ọsịịsọ hụ Meri na Josef, na nwata ahụ ka o dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri.
LUK 2:17 Mgbe ha hụrụ nke a, ha mere ka a mata ihe niile a gwara ha banyere nwantakịrị a.
LUK 2:18 Ihe ndị ọzụzụ atụrụ a kwuru juru ndị niile nụrụ ya anya.
LUK 2:19 Ma Meri debere ihe ndị a niile nʼobi ya, na-atụgharị ihe banyere ha nʼobi ya.
LUK 2:20 Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri, na-eto Chineke na-ebulikwa aha ya elu nʼihi ihe niile ha nụrụ ma hụkwa, nke dịkwa ka a gwara ha.
LUK 2:21 Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, mgbe oge ruru ibi nwata ahụ ugwu, ha gụkwara ya aha. Aha ha nyere ya bụ Jisọs, aha ahụ mmụọ ozi nyere tupu a dị ime ya.
LUK 2:22 Mgbe oge zuru maka mmemme nke ịdị ọcha dị ka iwu Mosis siri dị, ha kutere ya na Jerusalem iche ya nʼihu Onyenwe anyị
LUK 2:23 (dịka e dere ya nʼiwu nke Onyenwe anyị, “Nwa mbụ ọbụla nke bụ nwoke ka a ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị”),
LUK 2:24 ha chụrụ aja dị ka e nyere nʼiwu Onyenwe anyị: “Ụmụ kpalakwukwu abụọ maọbụ ụmụ nduru abụọ.”
LUK 2:25 Ma lee, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ onye ezi omume bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya maka nkasiobi nke ndị Izrel.
LUK 2:26 Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka ọ mata na ọ gaghị anwụ ruo mgbe ọ hụrụ Kraịst nke Onyenwe anyị.
LUK 2:27 Site nʼodudu nke Mmụọ Nsọ, ọ batara nʼụlọnsọ ukwu, ma mgbe nne na nna nwata ahụ bụ Jisọs kubatara ya dị ka omenaala iwu si dị,
LUK 2:28 Simiọn kuuru ya nʼaka, kelee Chineke sị,
LUK 2:29 “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe dị ka i kwere na nkwa, ugbu a zilaga nwaodibo gị nʼudo.
LUK 2:30 Nʼihi na anya m ahụla nzọpụta gị,
LUK 2:31 nke i kwadoro nʼihu mba niile.
LUK 2:32 Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ, na ebube nke ndị gị Izrel.”
LUK 2:33 O juru nne na nna nwantakịrị ahụ anya ịnụ ihe ndị a e kwuru banyere ya.
LUK 2:34 Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ.
LUK 2:35 Ọ bụkwa site nʼụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche nke dị ọtụtụ nʼobi. Mma agha ga-adụwakwa mkpụrụobi nke gị onwe gị.”
LUK 2:36 O nwekwara onye amụma nwanyị, aha ya bụ Ana, ada Fanuel nke si nʼebo Asha. Ọ bụ ezigbo agadi nwanyị na-enweghị di, nʼihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri naanị afọ asaa.
LUK 2:37 Ọ nọọla dị ka nwanyị na-enweghị dị iri afọ asatọ na anọ. Ọ hapụghị ụlọnsọ, kama ọ nọgidere nʼefe ofufe ehihie na abalị, na-ibu ọnụ na-ekpe ekpere.
LUK 2:38 Nʼoge ahụ ọ bịarutere nʼebe ha nọ, nye Chineke ekele, kwuo okwu banyere nwantakịrị ahụ nye ndị niile na-ele anya maka mgbapụta Jerusalem.
LUK 2:39 Mgbe ha mesịrị ihe niile otu ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị, ha laghachiri obodo ha bụ Nazaret nke dị nʼime Galili.
LUK 2:40 Ma nwata ahụ toro bụrụ onye dị ike; o jupụtara nʼamamihe, amara Chineke dịnyekwaara ya.
LUK 2:41 Nʼafọ niile, ndị mụrụ ya na-aga Jerusalem nʼihi Mmemme Ngabiga.
LUK 2:42 Mgbe o ruru afọ iri na abụọ, ha gara maka mmemme dị ka omenaala si dị.
LUK 2:43 Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ka ndị mụrụ ya na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Ndị ha amataghị na o soghị ha na-alọta.
LUK 2:44 Ha chere na o sonyere nʼetiti njem. Ha gara ije otu ụbọchị tupu ha a malite ịchọ ya nʼetiti ndị ikwu na ibe, na ndị enyi ha.
LUK 2:45 Ma mgbe ha na-ahụghị ya, ha laghachiri Jerusalem na-achọkwa ya.
LUK 2:46 Ka ụbọchị atọ gasịrị, ha hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ebe ọ nọdụrụ nʼetiti ndị ode akwụkwọ, na-ege ha ntị na-ajụkwa ha ajụjụ.
LUK 2:47 Nghọta na ọsịsa ya juru ndị niile nụrụ okwu ya anya.
LUK 2:48 Mgbe ndị mụrụ ya hụrụ ya, ọ tụrụ ha nʼanya, ma nne ya sịrị ya, “Nwa m, gịnị mere i ji mesoo anyị mmeso dị otu a? Mụ na nna gị nọ na-achọgharị gị?”
LUK 2:49 Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-achọ m? Unu amaghị na aghaghị m ịnọ nʼụlọ Nna m?”
LUK 2:50 Ma ha aghọtaghị ihe ọ gwara ha.
LUK 2:51 Mgbe ahụ, o sooro ha laghachi Nazaret ma na-erubekwara ha isi. Ma nne ya dobere ihe ndị a niile nʼobi ya.
LUK 2:52 Jisọs na-aga nʼihu nʼamamihe na ogologo, ya na ihuọma nʼebe Chineke na nke mmadụ nọ.
LUK 3:1 Nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị Tiberiọs Siza, mgbe Pọntiọs Pailet bụ onye na-achị Judịa, ebe Herọd bụkwa onye na-achị akụkụ Galili, ma nwanne ya nwoke bụ Filip na-achị akụkụ Iturịa na Trakona, Laisania bụkwa onye na-achị akụkụ Abilin,
LUK 3:2 mgbe ahụ Anas na Kaịfas bụ ndịisi nchụaja, okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zekaraya nʼime ọzara.
LUK 3:3 Ọ gara nʼime obodo niile gbara Jọdan gburugburu na-ekwusa banyere baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.
LUK 3:4 Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.
LUK 3:5 A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala. Ụzọ gbagọrọ agbagọ ka a ga-eme ka o guzozie nke ọma, meekwa ka ụzọ ọjọọ niile dị larịị.
LUK 3:6 Mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke.’ ”
LUK 3:7 Jọn sịrị igwe mmadụ ndị na-apụta ka o mee ha baptizim sị, “Unu ụmụ ajụala! Onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa?
LUK 3:8 Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. Unu amalitekwala na-asị onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna.’ Nʼihi na agwa m unu na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ.
LUK 3:9 Ọ bụladị ugbu a, atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi, osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu tụba ya nʼime ọkụ.”
LUK 3:10 Ma igwe mmadụ ahụ jụrụ ya sị, “Gịnị ka anyị kwesiri ime?”
LUK 3:11 Ọ zara ha sị, “Onye ọbụla nwere uwe abụọ, ya nye onye ọ na-adịghị nke o nwere otu. Onye nwere nri ya meekwa otu ahụ.”
LUK 3:12 Ọ bụladị ndị ọna ụtụ bịakwara ka e mee ha baptizim. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, gịnị ka anyị kwesiri ime?”
LUK 3:13 Ọ sịrị ha, “Unu anatala karịa otu unu kwesiri ịnata.”
LUK 3:14 Ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Gịnịkwa ka anyị kwesiri ime?” Ọ sịrị ha, “Unu ejikwala ike apụnara ndị mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ebubo ụgha, ka afọ ju unu nʼụgwọ a na-akwụ unu.”
LUK 3:15 Ndị mmadụ ji olileanya na-eche na-atulekwa nʼobi ha ma Jọn ọ bụ Kraịst ahụ.
LUK 3:16 Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim.
LUK 3:17 Ihe ịfụcha ọka ya dị nʼaka ya, iji zachaa ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, ka e kponye ezi mkpụrụ ọka wiiti nʼime ọba, ma kpoba igbugbo ọka nʼime ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.”
LUK 3:18 O ji ọtụtụ okwu ọzọ dị iche iche dụọ ha ọdụ ma kwusaakwara ha oziọma.
LUK 3:19 Ma Eze Herọd, onye ọ tara ụta maka Herodịas nwunye nwanne ya nwoke, nakwa maka ihe ọjọọ dị iche iche ndị o mere,
LUK 3:20 tụkwasịkwara ihe nʼelu ihe ndị a niile, site na ịtụnye Jọn nʼụlọ mkpọrọ.
LUK 3:21 Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe ọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere.
LUK 3:22 Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
LUK 3:23 Jisọs agbaala ihe dị ka iri afọ atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Ọ bụ nwa (dịka ndị mmadụ chere) Josef, onye bụ nwa Heli;
LUK 3:24 Heli abụrụ nwa Matat, nwa Livayị, nwa Meliki, nwa Janayi, nwa Josef;
LUK 3:25 nwa Matatiyas, nwa Emọs, nwa Nehum, nwa Esili, nwa Nagayị;
LUK 3:26 nwa Maat, nwa Matatiyas, nwa Semein, nwa Josek, nwa Joda;
LUK 3:27 nwa Joanan, nwa Resa, nwa Zerubabel, nwa Shealtiel, nwa Neri;
LUK 3:28 nwa Meliki, nwa Adi, nwa Kosam, nwa Elmadam, nwa Er,
LUK 3:29 nwa Joshua, nwa Elieza, nwa Jorim, nwa Matat, nwa Livayị;
LUK 3:30 nwa Simiọn, nwa Juda, nwa Josef, nwa Jonam, nwa Eliakịm;
LUK 3:31 nwa Melea, nwa Mena, nwa Matata, nwa Netan, nwa Devid;
LUK 3:32 nwa Jesi, nwa Obed, nwa Boaz, nwa Salmọn, nwa Nashọn;
LUK 3:33 nwa Aminadab, nwa Ram, nwa Hezrọn, nwa Perez, nwa Juda;
LUK 3:34 nwa Jekọb, nwa Aịzik, nwa Ebraham, nwa Tera, nwa Nahọ;
LUK 3:35 nwa Serug, nwa Reu, nwa Peleg, nwa Eba, nwa Shela;
LUK 3:36 nwa Kenan, nwa Aafaksad, nwa Shem, nwa Noa, nwa Lamek;
LUK 3:37 nwa Metusela, nwa Enọk, nwa Jared, nwa Mahalalel, nwa Kenan;
LUK 3:38 nwa Enọsh, nwa Set, nwa Adam, nwa Chineke.
LUK 4:1 Jisọs, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, sitere na Jọdan lọta. Mmụọ nsọ duuru ya baa nʼọzara.
LUK 4:2 Ebe ahụ ka ekwensu nwara ya ọnwụnwa iri ụbọchị anọ. Nʼụbọchị ndị ahụ niile o righị nri ọbụla. Nʼikpeazụ agụụ gụrụ ya.
LUK 4:3 Ekwensu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọọ achịcha.”
LUK 4:4 Jisọs zara ya sị, “E dere ya, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’ ”
LUK 4:5 Ekwensu duuru ya rigoo nʼebe dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa, nʼotu ntabi anya.
LUK 4:6 Ọ gwara ya sị, “M ga-enye gị ikike niile ndị a na ebube ha. Ọ bụ m ka e nyere ha, e nwere m ike inye ha onye ọbụla m chọrọ inye ha.
LUK 4:7 Ya mere, ọ bụrụ na ị kpọọ isiala nye m, ha ga-abụ nke gị.”
LUK 4:8 Jisọs zara ya sị, “E deela ya: ‘Ị ga-akpọ isiala nye Onyenwe anyị Chineke gị, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ ”
LUK 4:9 Ekwensu duuru ya gaa Jerusalem, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, si nʼebe a tụda onwe gị nʼala.
LUK 4:10 Nʼihi na e dere ya, “ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ichekwa gị nke ọma;
LUK 4:11 ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha, ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’”
LUK 4:12 Jisọs zara ya sị, “E kwuola ya, Anwala Onyenwe anyị Chineke gị ọnwụnwa. ”
LUK 4:13 Mgbe ekwensu nwasịrị ya ọnwụnwa ndị a niile, ọ hapụrụ ya ruo mgbe ohere ọzọ dapụtara.
LUK 4:14 Jisọs lọghachiri na Galili nʼike nke Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ obodo niile.
LUK 4:15 O ziri ihe nʼọtụtụ ụlọ ekpere ha, mmadụ niile na-etokwa ya.
LUK 4:16 Mgbe o rutere Nazaret ebe ọ nọrọ too, nʼụbọchị izuike, ọ gara nʼụlọ ekpere dị ka ọ dị mbụ eme. O guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ.
LUK 4:17 E nyere ya akwụkwọ nke onye amụma Aịzaya dere. O meghere ya chọta ebe e dere sị,
LUK 4:18 “Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na o teela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ, ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì, ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha.
LUK 4:19 Ikwupụta afọ Onyenwe anyị ga-eme amara.”
LUK 4:20 O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya.
LUK 4:21 Ma o bidoro ịgwa ha sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ a mezuru na ntị unu.”
LUK 4:22 Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?”
LUK 4:23 Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ Sikwa m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na Kapanọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’ ”
LUK 4:24 Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya.
LUK 4:25 Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala Izrel afọ atọ na ọnwa isii.
LUK 4:26 Ma e zigaghị Ịlaịja ka o jekwuru onye ọbụla nʼime ha karịakwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ nʼobodo Zarefat nʼakụkụ Saịdọn.
LUK 4:27 Nʼoge Ịlaisha onye amụma, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nʼala Izrel, ma o nweghị onye e mere ka ọ dị ọcha nʼetiti ha karịakwa Neeman onye Siria.”
LUK 4:28 Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu.
LUK 4:29 Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ.
LUK 4:30 Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya.
LUK 4:31 O sitere nʼebe ahụ gaa Kapanọm, obodo dịkwa na Galili. Nʼụbọchị izuike, o bidoro izi ha ihe.
LUK 4:32 Ozizi ya juru ha anya, nʼihi na okwu ya nwere ikike.
LUK 4:33 Otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ, onye mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya. O tiri mkpu nʼoke olu,
LUK 4:34 “Hapụ anyị! Gịnị ka ị na-achọ nʼebe anyị nọ, gị, Jisọs onye Nazaret? Ị bịara ka ị laa anyị nʼiyi? Ama m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke!”
LUK 4:35 Jisọs baara ya mba sị, “Nọrọ jii! Si nʼime ya pụta.” Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ tụdara ya nʼala nʼihu ha niile, o sikwa nʼime ya pụọ ma o merụghị ya ahụ.
LUK 4:36 Ihe ndị a juru ha niile anya, ha jụrịtara ibe ha sị, “Gịnị bụ ozizi nke a? O ji ịchị isi na ike na-enye mmụọ na-adịghị ọcha ndị a iwu, ha na-apụtakwa!”
LUK 4:37 Akụkọ banyere ya gbasara jeruo obodo niile dị ebe ahụ gburugburu.
LUK 4:38 Mgbe ọ hapụrụ ụlọ ekpere ahụ gaa nʼụlọ Saimọn. Nne nwunye Saimọn nwere ahụ ọkụ, ha rịọrọ ya ka o nyere ya aka.
LUK 4:39 O guzoro nʼihu ya, ma baara ahụ ọkụ ahụ mba, ọ hapụrụ ya nʼotu ntabi anya ahụ. O bilikwara lee ha ọbịa.
LUK 4:40 Mgbe anyanwụ na-ada, ọtụtụ ndị nwere ndị na-arịa ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute Jisọs. O bikwasịrị ha niile aka nʼotu nʼotu, gwọọ ha.
LUK 4:41 Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nʼime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke.” Ma ọ baara ha mba, o kweghị ka ha kwuo okwu, nʼihi na ha matara na ọ bụ Kraịst.
LUK 4:42 Mgbe chi bọrọ, ọ pụrụ gaa ebe naanị ya nọ. Ndị mmadụ nọ na-achọgharị ya; mgbe ha bịaruru ebe ọ nọ, ha gbalịsịrị ike ime ka ọ ghara ịhapụ ha.
LUK 4:43 Ma ọ sịrị ha, “Aghaghị m ikwusa oziọma alaeze Chineke nʼobodo ndị ọzọ, nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka e zitere m.”
LUK 4:44 Ọ gara nʼihu na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere niile dị na Judịa.
LUK 5:1 Otu oge, ka Jisọs guzo nʼakụkụ ọdọ mmiri Genesaret. Igwe mmadụ gbara ya gburugburu ka ha nụrụ okwu Chineke.
LUK 5:2 Ọ hụrụ nʼọnụ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri abụọ nke ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ gaa ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ.
LUK 5:3 Ọ banyere nʼime otu ụgbọ mmiri ndị ahụ, nke bụ nke Saimọn, ọ rịọrọ ya ka ọ kwọrọ ya banyetụ ntakịrị nʼime mmiri. Ọ nọdụrụ ala nʼime ya bido na-ezi igwe mmadụ ihe.
LUK 5:4 Mgbe o kwusiri okwu, ọ gwara Saimọn sị, “Banyetụkwuo nʼime mmiri, tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ.”
LUK 5:5 Saimọn zara sị, “Nna anyị ukwuu, anyị rụsịrị ọrụ ike abalị niile na-egbutaghị ihe ọbụla, ma otu i sịrị kwuo, aga m awụnye ụgbụ azụ niile.”
LUK 5:6 Mgbe ha mere nke a, ha gbutere ọtụtụ azụ nke mere na ụgbụ azụ ha malitere ịdọkasị.
LUK 5:7 Ha kpọrọ ndị ọkụ azụ ibe ha nọ nʼụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịara kpojuo azụ nʼụgbọ mmiri abụọ ahụ nke malitere imikpu.
LUK 5:8 Ma mgbe Saimọn Pita hụrụ nke a, ọ dara nʼukwu Jisọs sị, “Si nʼebe m nọ pụọ, Onyenwe m, nʼihi na abụ m onye mmehie.”
LUK 5:9 Nʼihi na o juru ya na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere.
LUK 5:10 Ọ bụladị Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, ndị ha na Saimọn na-arụkọ ọrụ, ka ihe a jukwara anya. Mgbe ahụ Jisọs gwara Saimọn sị, “Atụla egwu, nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, ị ga na-akụta mmadụ.”
LUK 5:11 Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ mmiri ha nʼelu ala, ha hapụrụ ihe niile soro ya.
LUK 5:12 Mgbe Jisọs nọ nʼotu obodo, otu nwoke onye ekpenta juru ahụ, bịara daa, kpudo ihu ya nʼala mgbe ọ hụrụ ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
LUK 5:13 Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, bụrụ onye dị ọcha!” Ngwangwa ekpenta ahụ hapụrụ ya.
LUK 5:14 O nyere ya iwu, “A gwakwala onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu maka ime ka ị dị ọcha, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”
LUK 5:15 Ma akụkọ banyere ya gbasara karịa, nke mere na igwe mmadụ bịara ịnụrụ ihe ọ na-ekwu, na ka a gwọọkwa ha nrịa nrịa.
LUK 5:16 Ma site nʼoge ruo nʼoge, Jisọs na-ewezuga onwe ya gaa nʼebe ọ ga-anọ naanị ya ikpe ekpere.
LUK 5:17 Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ndị Farisii na ndị ozizi iwu (sitere nʼobodo nta niile dị na Galili na Judịa na Jerusalem bịa nọdụkwa ebe) ahụ. Ike Chineke dịnyekwaara ya ịgwọ ndị ọrịa.
LUK 5:18 Nʼoge ahụ ndị ikom ụfọdụ bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼihe ndina ya, bịara gbalịa isite nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ bubata ya tọgbọ ya nʼụkwụ ya.
LUK 5:19 Mgbe ha na-enweghị ike ime nke a nʼihi igwe mmadụ, ha rigooro nʼelu ụlọ, site nʼoghere wetuo nwoke ahụ nʼute ya nʼetiti igwe mmadụ nʼihu Jisọs.
LUK 5:20 Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị, “Enyi m, a gbagharala gị mmehie gị.”
LUK 5:21 Ndị Farisii na ndị ozizi iwu malitere iche nʼime obi ha sị, “Onye bụ onye a na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie, ma ọ bụghị naanị Chineke?”
LUK 5:22 Mgbe Jisọs matara ihe ha na-ajụ, ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe ndị a nʼobi unu?
LUK 5:23 Olee nke ka mfe ikwu: Ọ bụ a gbagharala gị mmehie gị niile, ka ọ bụ ị sị, Bilie jee ije?
LUK 5:24 Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Asị m gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị!”
LUK 5:25 Ngwangwa, o biliri ọtọ nʼihu mmadụ niile, chịrị ihe ndina ya bido na-eto Chineke na-ala nʼụlọ ya.
LUK 5:26 Ihe ndị a juru onye ọbụla anya, ha tokwara Chineke. Oke egwu jupụtakwara ha nʼahụ, ha sịrị, “Anyị ahụla ihe ebube taa.”
LUK 5:27 Mgbe nke a gasịrị, ọ pụrụ hụ otu onye ọna ụtụ aha ya bụ Livayị, ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ ya. Ọ sịrị ya, “Soro m.”
LUK 5:28 Ngwangwa, o biliri, hapụ ihe niile soro ya.
LUK 5:29 Emesịa, Livayị kwadooro Jisọs oke oriri nʼụlọ ya, ọtụtụ igwe ndị ọna ụtụ na ndị ọzọ soo ha nʼoriri ahụ.
LUK 5:30 Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-ajụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere unu ji soro ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri na-aṅụkọkwa ihe ọṅụṅụ?”
LUK 5:31 Jisọs zara sị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike.
LUK 5:32 Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie ka ha chegharịa.”
LUK 5:33 Ha sịrị, “Ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na-ebu ọnụ, na-ekpe ekpere oge niile, ma ndị na-eso ụzọ gị na-eri, na-aṅụkwa.”
LUK 5:34 Jisọs sịrị ha, “Ndị a kpọrọ oriri nʼọlụlụ di na nwunye, ha ga-ebu ọnụ mgbe ha na onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ?
LUK 5:35 Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.”
LUK 5:36 Ọ tụụrụ ha ilu a, “O nweghị onye na-adọkara akwa ọhụrụ were ya kwachie akwa ochie. Ọ bụrụ na e mee nke a, ọ pụtara na a dọwaala akwa ọhụrụ ahụ nʼihi na nke ahụ eji kwachie ya agaghị adaba.
LUK 5:37 Nʼụzọ dị otu a kwa, mmadụ adịghị agbanye mmanya ọhụrụ dị ike nʼime karama akpụkpọ ochie. Nʼihi na ike si na mmanya ọhụrụ ahụ ga-eme ka karama ahụ gbawaa. Mmanya ahụ ga-awụfukwa, karama ahụ a laa nʼiyi.
LUK 5:38 Ma ọ dị mma ịgbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.
LUK 5:39 O nweghị onye ṅụsịrị mmanya ochie ga-achọ ịṅụ mmanya ọhụrụ, nʼihi na ọ ga-asị, ‘Nke ochie ahụ ka mma.’ ”
LUK 6:1 Nʼotu ụbọchị izuike, mgbe Jisọs na-agafe nʼubi a kụrụ ọka. Ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọrọ ụfọdụ nʼime ogbe ọka ndị ahụ, na-amazu ha nʼaka, ma na-ata ha.
LUK 6:2 Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Gịnị mere unu ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike?”
LUK 6:3 Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtaghị ihe Devid mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị so ya?
LUK 6:4 Otu o si banye nʼụlọ Chineke, were achịcha a na-eche nʼihu ya, nyetụkwa ndị ya na ha so, achịcha nke onye ọbụla na-ekwesighị ịta ma ọ bụghị naanị ndị nchụaja.”
LUK 6:5 Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe Ụbọchị Izuike.”
LUK 6:6 Nʼụbọchị izuike ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere na-ezi ihe. Otu nwoke nọkwa nʼebe ahụ onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
LUK 6:7 Ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ọrịa nʼụbọchị izuike.
LUK 6:8 Ma ebe ọ maara ihe ha na-ezube nʼobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Bilie bịa guzoro nʼetiti ebe a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe ahụ.
LUK 6:9 Mgbe ahụ Jisọs sịrị ha, “Ka m jụọ unu, gịnị ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike; ọ bụ ime ihe ọma ka ọ bụ ime ihe ọjọọ; ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?”
LUK 6:10 Mgbe o lesiri ha niile anya gburugburu, ọ sịrị ya, “Setịpụ aka gị.” O mere nke a, aka ya dịkwara mma ọzọ.
LUK 6:11 Ha were iwe nke ukwuu ma malite na-ekwurịtara nʼetiti onwe ha ihe ha nwere ike ime Jisọs.
LUK 6:12 Nʼụbọchị ndị ahụ, ọ gara rigoro nʼelu ugwu ikpe ekpere. Ọ nọrọ abalị ahụ niile na-ekpe ekpere nye Chineke.
LUK 6:13 Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị niile na-eso ụzọ ya, site nʼime ha họrọ mmadụ iri na abụọ ndị ọ kpọrọ ndị ozi ya.
LUK 6:14 Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita) na Andru nwanne ya, Jemis Jọn, Filip Batalomi.
LUK 6:15 Matiu Tọmọs, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt.
LUK 6:16 Judas nwa Jemis na Judas Iskarịọt onye raara ya nye.
LUK 6:17 Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn.
LUK 6:18 Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu.
LUK 6:19 Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile.
LUK 6:20 O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu.
LUK 6:21 Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị.
LUK 6:22 Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ.
LUK 6:23 “Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.
LUK 6:24 “Ma ahụhụ na-adịrị unu ndị ọgaranya, nʼihi na unu eketala nkasiobi unu.
LUK 6:25 Ahụhụ na-adịrị ndị afọ juru ugbu a, nʼihi na agụ ga-agụkwa unu. Ahụhụ na-adịrị ndị na-achị ọchị ugbu a, nʼihi na unu ga-eru ụjụ, bee akwa.
LUK 6:26 Ahụhụ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ niile na-ekwu okwu ọma gbasara unu, nʼihi na otu a ka ndị bụ nna ha mesoro ndị amụma ụgha.”
LUK 6:27 “Ma a na m agwa unu ndị na-ege m ntị: hụnụ ndị iro unu nʼanya, mekwaaranụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma.
LUK 6:28 Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpekwaaranụ ndị na-akparị unu ekpere.
LUK 6:29 Ọ bụrụ na onye ọbụla a maa gị ụra nʼotu ntị, tụgharịara ya ntị gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị.
LUK 6:30 Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Ọ bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya.
LUK 6:31 Dịka unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu, sitekwanụ otu a na-emeso ha.
LUK 6:32 “Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ọbụladị ndị mmehie, ọ bụ ndị hụrụ ha nʼanya ka ha na-ahụkwa nʼanya.
LUK 6:33 Ọ bụrụkwa naanị ndị na-emere unu ihe ọma ka unu na-emere ihe ọma, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-enyekwara ndị na-enyere ha aka aka.
LUK 6:34 Ọ bụrụkwa na unu agbazinye naanị ndị nwere ike ịkwụghachi unu ihe, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmehie ibe ha na-atụ anya ka a kwụghachikwa ha nʼozuzu oke.
LUK 6:35 Hụnụ ndị iro unu nʼanya, na-emekwa ezi ihe nye ha, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Mgbe ahụ, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ nke Onye kachasị ihe niile elu, nʼihi na ebere ya na-adịrị ndị ajọ omume na ndị na-enweghị mmụọ ekele nʼime ha.
LUK 6:36 Nweenu obi ebere dị ka Nna unu si nwee obi ebere.
LUK 6:37 “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. Unu amala ndị ọzọ ikpe ka a ghara ịma unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu.
LUK 6:38 Nyenụ, nʼihi na a ga-enyekwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ nke juru eju, nke a bịadara nke ọma, yọkọtakwa ayọkọta nke na-ejubiga oke ka a ga-adọkwasị gị nʼahụ; nʼihi na ọ bụ ihe i na-eji atụ ihe ka a ga-eji tụọrọ gị.”
LUK 6:39 Ọ tụkwaara ha ilu a, “Onye ìsì ọ pụrụ idu onye ìsì ibe ya? Ha abụọ ọ gaghị adaba nʼime olulu?
LUK 6:40 Onye na-eso ụzọ onye ozizi anaghị akarị onye nkuzi ya, kama mgbe ọ mụtasịrị ọ ga-amata ihe dị ka onye nkuzi ya.
LUK 6:41 “Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya, ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya?
LUK 6:42 Ị ga-esi aṅaa sị nwanna gị, ‘Nwanna a, ka m wepụ gị ntakịrị ahịhịa dị gị nʼanya,’ mgbe gị onwe gị na-ahụghị obodobo osisi dị gị nʼanya? Gị onye ihu abụọ, buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ nke ọma wepụ ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya.
LUK 6:43 “Ezi osisi adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Ọ dịkwaghị osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọma.
LUK 6:44 Ọ bụ mkpụrụ osisi mịrị ka e ji ama ụdị osisi ọ bụ. Ndị mmadụ adịghị aghọta fiig site nʼosisi ogwu, otu a kwa o nweghị onye na-aghọta mkpụrụ grepu nʼobi ogwu.
LUK 6:45 Ezi mmadụ na-esite nʼakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ọrụ, otu a kwa, ajọ mmadụ na-esite nʼobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ọrụ. Nʼihi na ihe ọbụla dị mmadụ nʼobi bụ ihe na-apụta nʼọnụ ya.
LUK 6:46 “Gịnị mere unu ji na-akpọ m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ma unu adịghị eme ihe m kwuru?
LUK 6:47 Achọrọ m igosi unu ihe onye ọbụla na-abịakwute m nke na-anụ okwu m, ma na-ejikwa ihe ọ na-anụ akpọrọ ihe, yiri.
LUK 6:48 Onye ahụ yiri nwoke wuru ụlọ, onye gwumiri ala, doo ntọala ụlọ ahụ nʼelu oke nkume. Mgbe idee mmiri bịara were ike ya tie nʼụlọ ahụ, o nweghị ike ime ka ọ maa jijiji nʼihi na e wusiri ya ike.
LUK 6:49 Ma onye ahụ nụrụ okwu m, nke na-ejighị ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke wukwasịrị ụlọ ya nʼelu ala, nke na-enweghị ntọala ọbụla. Mgbe idee mmiri bịara were ike ya tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala, ọdịda ya dị ukwuu.”
LUK 7:1 Mgbe o kwusiri okwu ndị a nye ndị na-ege ya ntị, ọ banyere na Kapanọm.
LUK 7:2 Ma e nwere otu ọchịagha nke nwere otu ohu nwoke ọ hụrụ nʼanya. Onye nọ nʼọrịa na nʼọnụ ọnwụ.
LUK 7:3 Mgbe ọ nụrụ ihe banyere Jisọs, o zipụrụ ụfọdụ ndị okenye ndị Juu ka ha gaa rịọrọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya.
LUK 7:4 Mgbe ha bịakwutere Jisọs, ha rịọsiri ya arịrịọ ike sị, “O kwesiri ka i mere ya ihe a.
LUK 7:5 Nʼihi na ọ hụrụ obodo anyị nʼanya. O wukwaara anyị ụlọ ekpere.”
LUK 7:6 Jisọs sooro ha gawa. Ma mgbe ọ nọ nso nʼụlọ ya, onye ọchịagha ahụ zipụrụ ndị enyi ya ka ha ga sị ya, “Onyenwe anyị, esogbukwala onwe gị, nʼihi na etorughị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m.
LUK 7:7 Ọ bụ ya mere na-echeghị m na m toruru ịpụta bịa zute gị. Ma kwuo okwu, ọ ga-agwọkwa odibo m.
LUK 7:8 Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a ‘gaa,’ ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ ‘bịa,’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a,’ ọ na-emekwa ya.”
LUK 7:9 Mgbe Jisọs nụrụ okwu niile a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ tụgharịrị gwa igwe mmadụ ndị na-eso ya sị, “Asị m unu, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ọ bụladị nʼIzrel.”
LUK 7:10 Mgbe ndị ozi ahụ laghachiri nʼụlọ, ha chọpụtara na ahụ adịla ohu ahụ mma.
LUK 7:11 O ruo mgbe nwa oge gasịrị, ọ gara nʼobodo a na-akpọ Nain. Ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ ndị ọzọ sooro ya gaa.
LUK 7:12 Mgbe ọ na-abịaru nso nʼọnụ ụzọ e si abata nʼobodo ahụ, o nwere otu nwoke nwụrụ anwụ nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ. Nne ya ahụ bụ nwanyị di ya nwụrụ, oke igwe mmadụ si nʼobodo ahụ sonyekwara ya.
LUK 7:13 Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o meere ya obi ebere ma sị ya, “Ebela akwa.”
LUK 7:14 Mgbe ahụ ọ gara nso metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ya kwụsịrị. Ọ sịrị, “Nwokorobịa, asị m gị bilie!”
LUK 7:15 Nwoke ahụ nwụrụ anwụ biliri, nọdụ ala, bido ikwu okwu, ọ kpọnyere ya nne ya.
LUK 7:16 Egwu tụrụ ha niile, ha tokwara Chineke sị, “Onye amụma dị ukwuu apụtala nʼetiti anyị, Chineke abịala inyere ndị ya aka!”
LUK 7:17 Akụkọ a banyere ya ruru Judịa niile na obodo nta niile gbara ya gburugburu.
LUK 7:18 Ndị na-eso ụzọ Jọn kọọrọ ya maka ihe ndị a niile. Jọn kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya,
LUK 7:19 zie ha ka ha jekwuru Onyenwe anyị jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa. Ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?”
LUK 7:20 Mgbe ụmụ nwoke ahụ bịakwutere ya, ha sịrị, “Jọn omee baptizim ziri anyị ka anyị jụọ gị sị, ‘Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?’ ”
LUK 7:21 Mgbe ahụ ọ gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa, na nrịa nrịa dị iche iche, na mmụọ ọjọọ. O mekwara ka ọtụtụ ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ.
LUK 7:22 Ọ zaghachiri ndị ozi ahụ sị, “Laghachinụ azụ gaa kọrọ Jọn ihe unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị kpuru ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije, ndị ekpenta ka a na-eme ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie, a na-ezisara ndị ogbenye oziọma.
LUK 7:23 Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.”
LUK 7:24 Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn pụrụ, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, “Gịnị ka unu gara nʼọzara ịhụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị?
LUK 7:25 Ma gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? E e, ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa, ndị na-ebikwa nʼoke oriri na oke ọṅụṅụ bi nʼụlọeze.
LUK 7:26 Ma gịnị ka unu pụrụ ka unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, ana m a gwa unu, unu hụrụ onye karịrị onye amụma.
LUK 7:27 Ọ bụ onye a bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya sị, “ ‘Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’
LUK 7:28 Agwa m unu, nʼetiti ndị nwanyị mụrụ, ọ dịghị onye dị ukwuu karịa Jọn, ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya.”
LUK 7:29 (Ndị mmadụ niile nụrụ nke a, tinyekwara ndị ọna ụtụ, nabatara nʼụzọ Chineke bụ nke ziri ezi, nʼihi na Jọn emela ha baptizim.
LUK 7:30 Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ imezu ebumnobi Chineke nye ha onwe ha, nʼihi na ha anabataghị ka Jọn mee ha baptizim.)
LUK 7:31 Ọ gara nʼihu sị ha, “Ma gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri?
LUK 7:32 Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nʼọma ahịa na-akpọ ibe ha oku na-asị, “ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu adịghị ete egwu. Anyị bụrụ abụ ịkwa ozu, ma unu ebeghị akwa.’
LUK 7:33 Nʼihi na Jọn omee baptizim bịara na-erighị achịcha maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma unu sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’
LUK 7:34 Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ma unu sịrị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’
LUK 7:35 Ma e sitela nʼụmụ ya niile nwapụta amamihe nʼonye ziri ezi.”
LUK 7:36 Otu onye nʼime ndị Farisii kpọrọ ya oriri. Ọ gara nʼụlọ onye Farisii ahụ, ma nọdụ ala nʼoche nri.
LUK 7:37 Ma otu nwanyị nke bi nʼobodo ahụ, onye birila ndụ mmehie, mgbe ọ matara na ọ nọ nʼụlọ onye Farisii ahụ na-eri nri, o jiri otu karama alabasta mmanụ otite bata nʼụlọ ahụ.
LUK 7:38 Ka o guzoro nʼazụ ụkwụ ya na-ebe akwa, ọ malitere iji anya mmiri ya na-awụsa nʼụkwụ ya. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri ahụ, sutu ụkwụ ya ọnụ, ma wụsa mmanụ otite isi ụtọ ahụ na ha.
LUK 7:39 Mgbe onye Farisii ahụ kpọrọ ya oriri hụrụ ihe nke a, o kwuru nʼobi ya sị, “A sị na nwoke a bụ onye amụma, ọ gaara amata ụdị mmadụ nwanyị a na-emetụ ya aka bụ, na ọ bụ onye mmehie.”
LUK 7:40 Jisọs zara ya sị, “Saimọn, e nwere m ihe m chọrọ ịgwa gị.” Ọ sịrị ya, “Onye ozizi gwa m ya.”
LUK 7:41 “Ndị ikom abụọ ji onye na-ebinye ndị mmadụ ego nʼọmụrụnwa ụgwọ. Otu onye ji ya narị ego ise, onye nke ọzọ ji ya iri ego ise.
LUK 7:42 Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ha ji ya, ọ gbaghara ha ụgwọ ahụ. Ugbu a, onye nʼime ha ga-ahụ ya nʼanya karịa?”
LUK 7:43 Saimọn zara sị, “Ọ dị m ka ọ bụ onye nke ọ gbaghara ụgwọ dị ukwuu.” Ọ sịrị ya, “Ị kpeziri.”
LUK 7:44 Mgbe ahụ ọ tụgharịrị nʼebe nwanyị ahụ nọ gwa Saimọn sị, “Ị hụrụ nwanyị a? A batara nʼụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha.
LUK 7:45 Ị sutughị m ọnụ, ma kemgbe m batara nʼụlọ a, o zubeghị ike isutu ụkwụ m ọnụ.
LUK 7:46 Ị teghị m mmanụ ọbụla nʼisi, ma lee, o werela mmanụ otite isi ụtọ wụkwasị m nʼụkwụ.
LUK 7:47 Ya mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya niile o mehiere, nʼihi na ọ nwere ịhụnanya dị ukwuu. Ma onye nwetara mgbaghara dị nta, na-enwe ịhụnanya dị nta.”
LUK 7:48 Mgbe ahụ ọ gwara ya sị, “A gbagharala gị mmehie gị.”
LUK 7:49 Ma ndị ọzọ soro ya nọdụ na-eri nri bidoro ikwu nʼetiti onwe ha na-asị, “Onye bụ onye a nwere ike ọ bụladị ịgbaghara mmehie?”
LUK 7:50 Ọ sịrị nwanyị ahụ, “Okwukwe gị azọpụtala gị, laa nʼudo.”
LUK 8:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ọ gara nʼobodo ukwu niile na nʼobodo nta niile na-ekwusa ma na-ewetakwara ndị mmadụ oziọma nke alaeze Chineke. Ndị ozi iri na abụọ ahụ sokwa ya,
LUK 8:2 na ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ site nʼime ha, gwọkwa ha nrịa nrịa: Meri Magdalin onye e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa,
LUK 8:3 na Joana nwunye Chuza onye na-elekọta ụlọeze Herọd na akụ ya niile, na Suzana, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị ji akụ ha na-enyere ha aka.
LUK 8:4 Mgbe oke igwe mmadụ gbakọrọ ha na ndị mmadụ si nʼobodo dị iche iche bịakwute ya. Ọ tụụrụ ha ilu a sị,
LUK 8:5 “Ọgha mkpụrụ pụrụ ịkụ mkpụrụ ya, mgbe ọ nọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime mkpụrụ ahụ dara nʼakụkụ ụzọ ebe ndị mmadụ zọrọ ha ụkwụ, ụmụ nnụnụ bịakwara tụrịa ha loo.
LUK 8:6 Ụfọdụ nʼime ha dakwasịrị nʼelu nkume. Mgbe ha puputara chọọ ito, ha kpọnwụrụ nʼihi na mgbọrọgwụ ha enweghị ike ịmịta mmiri mkpụrụ ahụ ga-eji dị ndụ.
LUK 8:7 Ụfọdụ dara nʼetiti ogwu, ogwu ndị a sooro ha puo ma kpagbuo ha.
LUK 8:8 Ụfọdụ nʼime mkpụrụ dara nʼezi ala. Ha puputara, too, mịa mkpụrụ dị otu narị nʼọnụọgụgụ.” Mgbe o kwusiri nke a, ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
LUK 8:9 Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ilu a pụtara.
LUK 8:10 Ọ sịrị, “Ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze Chineke, ma ndị ọzọ ga-anụ ya naanị nʼilu. Site nʼụzọ dị otu a, “ ‘ha ga na-ele anya, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla. Ha ga na-anụ ntị ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla.’
LUK 8:11 “Nke a bụ nkọwa ilu ahụ. Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke.
LUK 8:12 Mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ nʼobi ha, ka ha ghara ikwere ma nwetakwa nzọpụta.
LUK 8:13 Mkpụrụ ndị ahụ dara nʼelu nkume nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke jiri ọṅụ nabata ya, ma ha enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-ekwere naanị nwa oge nta, ma mgbe ọnwụnwa bịara ha na-adachapụ.
LUK 8:14 Mkpụrụ nke dara nʼetiti ogwu nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma mgbe ha na-aga nʼụzọ ha, echiche banyere akụ na ihe ụtọ nke ụwa na-akpagbu okwu ahụ, mee ka ha ghara ịmị mkpụrụ.
LUK 8:15 Ma mkpụrụ ndị ahụ dara nʼezi ala nọchiri anya ndị jiri obi ghere oghe na mmụọ ziri ezi nabata okwu ahụ ma werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
LUK 8:16 “Ọ dịghị onye ọbụla, nke na-amụnye oriọna zoo ya nʼime igbe maọbụ dọnye ya nʼokpuru ihe ndina. Kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị ọbụla na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ.
LUK 8:17 Ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe ọbụla dị nzuzo nke a na-aghaghị eme ka ọ pụta ìhè.
LUK 8:18 Ya mere, kpacharanụ anya otu unu si ege ntị. Nʼihi na ọ bụ onye ahụ nwere ihe ka a ga-enye karịa, ma onye ahụ na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere, ka a ga-anapụ ya.”
LUK 8:19 Nʼoge a, nne ya na ụmụnne ya nwoke bịakwutere ya. Ma ha enweghị ike ịbịaru ya nso nʼihi igwe mmadụ.
LUK 8:20 Otu onye gwara ya sị, “Nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke guzo nʼezi, ha chọrọ ịhụ gị.”
LUK 8:21 Ọ zara sị, “Nne m na ụmụnne m ndị nwoke bụ ndị ahụ na-anụ okwu Chineke ma jiri ya mere ihe.”
LUK 8:22 Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri, ọ sịrị ha, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri.” Nke a mere ha ji nụpụ ụgbọ,
LUK 8:23 ma mgbe ha na-aga, ọ rahụrụ ụra. Oke ifufe malitere ife nʼelu ọdọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri na-awụbanye nʼime ụgbọ ha, mee ka ha nọrọ nʼoke nsogbu.
LUK 8:24 Ha gara kpọtee ya na-eti mkpu, “Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Lee na anyị nʼala nʼiyi!” O biliri, baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe niile dekwara jii.
LUK 8:25 Ọ sịrị ha, “Ebee ka okwukwe unu dị?” Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ na-enye ọ bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị.”
LUK 8:26 Ha kwọrọ ụgbọ mmiri rute nʼala Gerazin, nke dị nʼofe mmiri Galili.
LUK 8:27 Mgbe o si nʼụgbọ mmiri rịpụta nʼelu ala, otu nwoke obodo ahụ onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya zutere ya. Nwoke a ebighị nʼụlọ maọbụ yie uwe ogologo oge, ma ebe obibi ya bụ ebe a na-eli ozu.
LUK 8:28 Mgbe ọ hụrụ Jisọs, ọ bịara daa nʼihu ya, tie mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Biko arịọ m gị, atala m ahụhụ.”
LUK 8:29 Nʼihi na o nyela mmụọ ahụ na-adịghị ọcha iwu ka o site nʼime ya pụta. Ọtụtụ oge, mmụọ ọjọọ a na-ejidesi ya ike, nʼagbanyeghị na eji ụdọ igwe kee ya aka na ụkwụ, debe ebe a na-eche ya nche, ọ na-adọbisi ụdọ igwe e ji kee ya, mmụọ ọjọọ a na-eduru ya gaa nʼime ọzara.
LUK 8:30 Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Lijiọn,” nʼihi na igwe mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.
LUK 8:31 Ha rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara inye ha iwu ka ha banye nʼAbis.
LUK 8:32 Igwe ezi nọ nʼakụkụ ugwu dị ebe ahụ nso na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs ka o nye ha ike ka ha banye nʼime ha. Jisọs nyere ha ike.
LUK 8:33 Mmụọ ọjọọ ndị ahụ sitere nʼime nwoke a pụọ banye nʼime ezi ndị ahụ, igwe ezi ahụ niile sitere na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ gbara ọsọ dabanyechaa nʼime mmiri ebe osimiri riri ha.
LUK 8:34 Mgbe ndị na-elekọta ezi ahụ hụrụ ihe mere, ha gbara ọsọ gaa nʼime obodo na nʼobodo nta niile dị gburugburu ebe ahụ kọsaa ihe mere.
LUK 8:35 Ndị mmadụ pụtara ịhụ ihe mere. Mgbe ha rutere ebe Jisọs nọ, ha hụrụ nwoke ahụ e si nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ, ebe ọ nọdụrụ ala yiri uwe ma nọrọkwa nʼezi uche ya. Egwu tụrụ ha.
LUK 8:36 Ndị hụrụ ka ihe a si mee kọọrọ ha ka e siri gwọọ onye ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu.
LUK 8:37 Mgbe ahụ, ndị niile bi na Gerazin na nʼobodo gbara ebe ahụ gburugburu rịọrọ Jisọs ka ọ hapụrụ ha obodo ha, nʼihi na egwu dị ukwuu tụrụ ha. Ọ banyekwara nʼime ụgbọ mmiri ahụ laghachi.
LUK 8:38 Nwoke a e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ rịọrọ ya ka o soro ya ma o zilagara ya, sị ya,
LUK 8:39 “Laghachi nʼezinaụlọ gị kọọrọ ha ihe niile Chineke meere gị.” Nwoke ahụ lara, gbasaa akụkọ ihe Jisọs meere ya nʼobodo ahụ niile.
LUK 8:40 Mgbe Jisọs lọghachiri, igwe mmadụ nabatara ya nʼihi na ha niile na-eche ya.
LUK 8:41 Mgbe ahụ otu nwoke nke aha ya bụ Jairọs, onye bụ onyeisi nʼụlọ ekpere, bịara daa nʼala nʼụkwụ Jisọs na-arịọ ya ka ọ bịa nʼụlọ ya.
LUK 8:42 Nʼihi na otu nwata nwanyị ọ mụtara naanị ya, nke gbara afọ iri na abụọ nọ nʼọnụ ọnwụ. Mgbe ọ na-aga, igwe mmadụ ahụ na-akpagbu ya.
LUK 8:43 Ọ dị otu nwanyị nʼetiti ha nke nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ, onye mefuru ihe niile o ji nʼaka ndị dibịa, ma ọ dịghị onye nwere ike ịgwọ ya.
LUK 8:44 O sitere nʼazụ ya metụ ọnụ uwe ya aka. Ngwangwa, ọrịa oruru ọbara ahụ kwụsịkwara.
LUK 8:45 Jisọs sịrị, “Onye metụrụ m aka?” Mgbe ọ na-enweghị onye pụtara kwuo sị na ọ bụ ya. Pita gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-adakwasịkwa gị.”
LUK 8:46 Ma Jisọs sịrị, “Otu onye metụrụ m aka; amatara m na ike esitela nʼime m pụọ.”
LUK 8:47 Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe o nwere ike ime iji zoo onwe ya, o ji ịma jijiji bịa daa nʼụkwụ ya. Nʼihu mmadụ niile, ọ kọrọ ihe mere o ji metụ ya aka na otu e sị gwọọ ya nʼotu ntabi anya.
LUK 8:48 Ọ gwara ya sị, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo.”
LUK 8:49 Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ.”
LUK 8:50 Ma mgbe Jisọs nụrụ ozi a, ọ zara ya sị, “Atụla egwu, naanị kwere, a ga-agwọkwa ya.”
LUK 8:51 Mgbe o rutere nʼụlọ Jairọs, o kweghị ka onye ọbụla soro ya baa nʼime ụlọ ahụ ma ọ bụghị naanị Pita, Jọn, Jemis, nne na nna nwata ahụ.
LUK 8:52 Nʼoge ahụ, ha niile nọ na-ebe akwa na-eru ụjụ maka nwata ahụ. Ọ sịrị ha, “Unu ebezila akwa, nʼihi na ọ nwụghị anwụ kama ọ nọ nʼụra.”
LUK 8:53 Ha chịrị ya ọchị, nʼihi na ha matara na ọ nwụrụ anwụ.
LUK 8:54 Ma o jidere ya nʼaka, sị, “Nwa m, bilie!”
LUK 8:55 Mmụọ ya lọghachiri, o bilitekwara mgbe ahụ. Ọ gwakwara ha ka ha chọọrọ ya nri ka o rie.
LUK 8:56 Ihe a gbara ndị mụrụ ya gharịị ma ọ nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe mere.
LUK 9:1 Mgbe ọ kpọkọtara ndị ozi iri na abụọ ahụ, o nyere ha ike na ịchị isi nʼebe mmụọ ọjọọ niile nọ na ịgwọ ọrịa dị iche iche.
LUK 9:2 O nyere ha ikike, zipụ ha ikwusa alaeze Chineke na ịgwọ ndị nrịa nrịa.
LUK 9:3 Ọ gwara ha sị, “Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, maọbụ mkpanaka maọbụ akpa, maọbụ achịcha maọbụ ego maọbụ uwe abụọ.
LUK 9:4 Ụlọ ọbụla unu banyere, nọgidenụ nʼebe ahụ ruo mgbe unu hapụrụ obodo ahụ.
LUK 9:5 Ma ebe ọbụla a na-anabataghị unu, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ nʼobodo ahụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.”
LUK 9:6 Ha gara nʼobodo nta niile na-ekwusa oziọma na-agwọkwa ndị ọrịa nʼebe niile.
LUK 9:7 Mgbe Herọd onye ọchịchị nụrụ akụkọ banyere ihe niile merenụ, ọ gbagwojuru ya anya nʼihi na ụfọdụ mmadụ na-asị, na Jọn omee baptizim esitela na ndị nwụrụ anwụ bilie.
LUK 9:8 Ndị ọzọ na-asị na Ịlaịja apụtala, ebe ndị ọzọ na-asị na otu nʼime ndị amụma ochie apụtakwala ndụ ọzọ.
LUK 9:9 Ma Herọd sịrị, “Mụ onwe bipụrụ isi Jọn. Onye bụkwa onye a nke m na-anụ ihe banyere ya?” Ọ gụrụ ya agụụ ịhụ ya.
LUK 9:10 Mgbe ndị ozi a lọtara, ha kọọrọ ya ihe niile ha mere. Ọ kpọọrọ ha gaa nʼobodo a na-akpọ Betsaida ebe ha ga-anọ naanị ha.
LUK 9:11 Ma mgbe igwe mmadụ matara nke a, ha sooro ya. Ọ nabatara ha ma gwakwa ha okwu maka alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị niile ọ dị mkpa na-emere ka ahụ dị ha mma.
LUK 9:12 Mgbe anwụ bidoro ịda, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ bịakwutere ya sị ya, “Zilaga igwe mmadụ a ka ha gaa nʼime obodo na nʼobodo nta ndị gbara ebe a gburugburu, ka ha chọtara onwe ha nri na ebe ndina nʼihi na ebe a anyị nọ bụ ọzara.”
LUK 9:13 Ọ zara ha sị, “Unu nye ha nri ka ha rie.” Ha zaghachiri ya sị, “Anyị nwere naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ. Ma ọ bụghị na anyị ga aga zụọra mmadụ ndị a niile nri.”
LUK 9:14 Ndị nọ nʼebe ahụ ruru puku ndị nwoke ise. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Meenụ ka ha nọdụ ala nʼigwe nʼigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise.”
LUK 9:15 Ha mere otu ahụ, mee ka ha niile nọdụ ala.
LUK 9:16 O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lelie anya nʼeluigwe, gọzie ma nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere igwe mmadụ ahụ.
LUK 9:17 Ha niile riri rijuokwa afọ, a tụtụkọtara ihe fọdụrụ, tụtụjuo nkata iri na abụọ nʼiberibe achịcha fọdụrụ.
LUK 9:18 Otu ụbọchị mgbe ọ nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka igwe mmadụ na-asị na m bụ?”
LUK 9:19 Ha zara sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọ sị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọkwa, sị na ị bụ otu nʼime ndị amụma ochie ahụ si nʼọnwụ bilie.”
LUK 9:20 Ma ọ jụrụ ha, “Unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst nke Chineke.”
LUK 9:21 Ma ọ dọrọ ha aka na ntị, nyesiekwa ha iwu ike ka ha ghara ịgwa onye ọbụla nke a,
LUK 9:22 na-asị, “Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche. Ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya. Aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.”
LUK 9:23 Mgbe ahụ ọ sịkwara ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m nʼazụ, ọ ghaghị ịjụ onwe ya ma buru obe ya kwa ụbọchị na-eso m.
LUK 9:24 Nʼihi na onye ọbụla chọrọ ịzọpụta ndụ ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla nke tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-azọpụta ya.
LUK 9:25 Uru gịnị ka mmadụ nwere ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya, maọbụ bụrụ onye a napụrụ ndụ ya?
LUK 9:26 Onye ọbụla ihere m na ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa Nwa nke Mmadụ mgbe ọ ga-abịa nʼebube ya, na nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.
LUK 9:27 “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke.”
LUK 9:28 Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, ọ kpọọrọ Pita na Jọn na Jemis gaa nʼelu ugwu ikpe ekpere.
LUK 9:29 Mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere, ụdịdị ihu ya gbanwere. Uwe ya bidoro ịchaa ọcha nke ukwuu.
LUK 9:30 Nʼotu ntabi anya, ha hụrụ ndị ikom abụọ ka ha na ya na-ekwu okwu. Ha bụ Mosis na Ịlaịja.
LUK 9:31 Ha pụtara nʼebube eluigwe dị ukwu na-ekwu banyere nlaghachi ya, nke ọ na-aga imezu na Jerusalem.
LUK 9:32 Pita na ndị ya na ha nọ na-arahụ ụra. Mgbe ha tetara, ha hụrụ ebube ya na ndị ikom abụọ ya na ha nọ na-ekwurịta okwu.
LUK 9:33 Mgbe ha na-ahapụ ya, Pita sịrị Jisọs, “Nna anyị ukwu, ọ ga-adị mma ka anyị nọrọ ebe a ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ, otu ga-abụ nke gị, otu ga-abụ nke Mosis, otu ga-abụkwa nke Ịlaịja.” Ọ mataghị ihe ọ na-ekwu.
LUK 9:34 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Egwu tụkwara ha dị ka ha na-aba nʼigwe ojii ahụ.
LUK 9:35 Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họpụtara; geenụ ya ntị.”
LUK 9:36 Mgbe olu ahụ kwusiri okwu, ha chọpụtara na Jisọs nọ naanị ya. Ndị na-eso ụzọ ya kpuchiri ọnụ ha, debe ihe niile nʼobi ha, ọ dịkwaghị onye ọbụla ha gwara ihe ha hụrụ.
LUK 9:37 Nʼechi ya, mgbe ha si nʼugwu ahụ rịdata, oke igwe mmadụ bịara zute ya.
LUK 9:38 Otu nwoke si nʼetiti igwe mmadụ ahụ jiri oke olu tie mkpu sị, “Onye ozizi, arịọ m gị ka i lee nwa m nwoke anya, nʼihi na naanị ya bụ nwa m nwere.
LUK 9:39 Mmụọ ọjọọ na-ejide ya mee ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-atụda ya nʼala, na-ese ya ese, na-adọkwa ya adọ mee ka ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ. Ọ dịghị mgbe ọ na-ahapụ ya kama ọ na-echihịasị ya ahụ.
LUK 9:40 Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike.”
LUK 9:41 Jisọs zara sị, “Leenụ ọgbọ rụrụ arụ, nke na-enweghị okwukwe! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ, ruokwa olee mgbe ka m ga-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwa gị nwoke ahụ nʼebe a!”
LUK 9:42 Mgbe ọ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwadara ya nʼala sesie ya ike, ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba. Ọ gwọrọ nwata ahụ kpọnyekwa ya nna ya.
LUK 9:43 Ebube ukwu nke Chineke tụrụ ha nʼanya. Ma mgbe onye ọbụla nọ na mgbagwoju anya nʼihi ọrụ ọ rụrụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya,
LUK 9:44 “Geenụ ntị nke ọma banyere ihe m chọrọ ịgwa unu. A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ.”
LUK 9:45 Ma ha aghọtaghị okwu a. E zonarịrị ya nʼebe ha nọ ka ha ghara ịghọta ya. Egwu tụkwara ha ịjụ ya ihe ọ pụtara.
LUK 9:46 Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha banyere onye karịrị ibe ya ukwuu.
LUK 9:47 Ebe Jisọs ma ihe ha na-eche, ọ kpọtara otu nwantakịrị mee ka o guzo nʼakụkụ ya.
LUK 9:48 Ọ gwara ha sị, “Onye ọbụla nabatara nwata a nʼaha m, nabatara m. Onye ọ bụlakwa nabatara m, nabatara onye zitere m. Ọ bụkwa onye dịkarịsịrị nta nʼetiti unu bụ onye kachasị ukwuu.”
LUK 9:49 Jọn a zaa sị, “Nna anyị ukwu, anyị hụrụ otu onye ka o ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ. Ebe ọ na-esoghị anyị, anyị gbochiri ya.”
LUK 9:50 Jisọs sịrị ya, “Unu egbochila ya. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide unu dịnyeere unu.”
LUK 9:51 Mgbe oge o ji alaghachi na-abịaru nso, o chere ihu ya ịga Jerusalem.
LUK 9:52 O zipụrụ ndị ozi, ka ha buru ya ụzọ gawa. Ka ha na-aga ha batara nʼotu obodo nta nke ndị Sameria ịkwado ihe niile tupu ọ bịa;
LUK 9:53 ma ha jụrụ ịnabata ya nʼihi na o chere ihu ịga Jerusalem.
LUK 9:54 Mgbe Jemis na Jọn ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nʼeluigwe bịa laa ha nʼiyi?”
LUK 9:55 Ọ tụgharịrị bara ha mba.
LUK 9:56 Ma ha pụrụ banye nʼobodo nta ọzọ.
LUK 9:57 Mgbe ha nọ na-aga ije a, otu nwoke sịrị ya, “Aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.”
LUK 9:58 Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ, ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe ọ na-atụkwasị isi.”
LUK 9:59 Ọ gwara onye ọzọ sị, “Soro m.” Ma ọ sịrị ya. Onyenwe anyị, “Biko, nye m ohere ka m gaa buru ụzọ lie nna m.”
LUK 9:60 Ma ọ sịrị ya, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha. Ma gị gaa kwusaa alaeze nke Chineke.”
LUK 9:61 Ma onye ọzọkwa, sịrị ya, “Aga m eso gị, Onyenwe m, ma kwere ka m buru ụzọ gaa sị ndị ezinaụlọ m nọdụnụ nke ọma.”
LUK 9:62 Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla jidere aka nʼọgụ anụ ụlọ na-adọkpụ ma na-ele anya nʼazụ ekwesighị alaeze Chineke.”
LUK 10:1 Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị họpụtara iri mmadụ asaa na abụọ ndị ọzọ, zipụ ha mmadụ abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa nʼobodo niile nakwa ebe niile ọ na-achọ ịga.
LUK 10:2 Ọ sịrị ha, “Owuwe ihe ubi dị ukwuu ma ndị ọrụ dị naanị ole na ole. Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya.
LUK 10:3 Gaanụ! Ma lee, ana m ezipu unu dị ka ụmụ atụrụ nʼetiti agụ.
LUK 10:4 Unu ewerekwala ego maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ. Unu ekelekwala onye ọbụla nʼụzọ.
LUK 10:5 “Mgbe unu banyere nʼụlọ ọbụla, burunu ụzọ sị, ‘Udo dịrị nʼụlọ a.’
LUK 10:6 Ọ bụrụ na mmadụ udo bi nʼụlọ ahụ, udo unu ga-adịnyekwara ya. Ọ bụrụkwanụ na onye bi nʼụlọ ahụ abụghị onye udo, udo unu ji bịa ga-alọghachitekwara unu.
LUK 10:7 Nọgidenụ nʼebe ahụ, na-erinụ ma na-aṅụkwanụ ihe ọbụla ha nyere unu, nʼihi na onye ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya. Unu esitela nʼotu ụlọ gaa nʼụlọ ọzọ.
LUK 10:8 “Ọ bụrụ na ndị bi nʼobodo unu batara anabata unu, rienụ ihe ọbụla ha nyere unu.
LUK 10:9 Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nʼebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke adịla unu nso.’
LUK 10:10 Ma mgbe unu banyere nʼobodo ọbụla ha jụ ịnabata unu, pụọnụ gaa nʼokporoụzọ ya kwuo sị,
LUK 10:11 ‘Ọ bụladị aja si nʼobodo a nke nyapagidere nʼụkwụ anyị, anyị na-ehichapụ ya ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka ntị nye gị. Otu ọ dị, matakwanụ nke a, na alaeze Chineke dị nso.’
LUK 10:12 Ana m agwa unu na nʼụbọchị ahụ, ga-akara Sọdọm mma karịa obodo ahụ.
LUK 10:13 “Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịrị gị Betsaida. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ebube a rụrụ nʼime unu ka a rụrụ na Taịa na Saịdọn ha gaara echegharị ogologo oge, nọdụ nʼakwa mkpe na ntụ.
LUK 10:14 Ọ ga-akara Taịa na Saịdọn mma nʼụbọchị ikpe karịa unu.
LUK 10:15 Ma gị Kapanọm! Ị na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịda nʼala mmụọ!
LUK 10:16 “Onye ọbụla gere unu ntị, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọbụla jụrụ ịnabata unu, ọ bụ mụ ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọbụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata onye zitere m.”
LUK 10:17 Iri mmadụ asaa na abụọ ahụ jiri ọṅụ lọta sị, “Onyenwe anyị, nʼaha gị, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi.”
LUK 10:18 Ọ sịrị ha, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nʼeluigwe daa dị ka amụma.
LUK 10:19 Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ.
LUK 10:20 Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nʼihi na mmụọ ọjọọ rubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na e deela aha unu nʼeluigwe.”
LUK 10:21 Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya.
LUK 10:22 “Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara onye Ọkpara ahụ bụ, karịa Nna ahụ. Ọ dịkwaghị onye maara Nna ahụ karịa Ọkpara na ndị ahụ Ọkpara chọrọ igosi onye Nna ya bụ.”
LUK 10:23 Mgbe ahụ ọ tụgharịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya na nzuzo sị, “Ngọzị na-adịrị anya nke na-ahụ ihe unu na-ahụ ugbu a.
LUK 10:24 Ana m asị unu, na ọtụtụ ndị amụma na ndị eze ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya.”
LUK 10:25 Otu ụbọchị, otu onye ozizi iwu biliri ịnwale ya. Ọ jụrụ ya, “Onye ozizi, gịnị ka m kwesiri ime ka m keta ndụ ebighị ebi?”
LUK 10:26 Ọ sịrị ya, “Gịnị ka e dere nʼiwu? Gịnị ka ị gụtara nʼime ya?”
LUK 10:27 Ọ zara sị, “ ‘Ị ga-eji obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na ike gị niile, na uche gị niile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya’; ma ‘hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’”
LUK 10:28 Ọ sịrị ya, “Ị zara nke ọma. Gaa mee nke a ị ga-adị ndụ.”
LUK 10:29 Ma iji gosi na ya bụ onye na-eme ihe ziri ezi, ọ sịrị Jisọs, “Onye kwanụ bụ onye agbataobi m?”
LUK 10:30 Jisọs sịrị ya, “Otu nwoke sitere Jerusalem na-aga Jeriko, ọ dabara nʼaka ndị ohi, ndị gbara ya ọtọ, tiekwa ya ihe, hapụ ya nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma laa.
LUK 10:31 Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja sitere ụzọ ahụ na-agafe. Mgbe ọ hụrụ ya, o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafee.
LUK 10:32 Otu a kwa, otu onye Livayị bịarutekwara nʼebe ahụ, hụ ya, ma o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafeekwa.
LUK 10:33 Ma otu onye Sameria na-aga njem, mgbe ọ bịarutere nso nʼebe ahụ; hụ ya, o nwere ọmịiko nʼahụ ya.
LUK 10:34 Ọ gara nso nʼebe ọ nọ, jiri mmanya na mmanụ wụsa nʼọnya ya, were akwa kechie ya. Ọ tụkwasịrị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buba ya nʼụlọ ndị ije ebe o lekọtara ya anya nke ọma.
LUK 10:35 Nʼechi ya, o wepụtara mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie ya anya nke ọma. M lọta aga m akwụghachi gị ihe ọbụla ọzọ i mefuru.’
LUK 10:36 “Onye nʼime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbataobi nye nwoke ahụ nke dabara nʼaka ndị ohi?”
LUK 10:37 Ọ sịrị, “Ọ bụ onye ahụ meere ya ebere.” Jisọs sịrị ya, “Laa, gaa mee otu ahụ.”
LUK 10:38 Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya.
LUK 10:39 O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu.
LUK 10:40 Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.”
LUK 10:41 Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe,
LUK 10:42 maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.”
LUK 11:1 Ọ nọ nʼotu ebe na-ekpe ekpere, mgbe o kpesịrị ekpere, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, kuziere anyị ikpe ekpere, dị ka Jọn kuziri ndị na-eso ụzọ ya.”
LUK 11:2 Ọ sịrị ha, “Mgbe unu na-ekpe ekpere, sịnụ: “ ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ ka alaeze gị bịa.
LUK 11:3 Nye anyị taa nri nke ụbọchị anyị.
LUK 11:4 Gbaghara anyị mmehie anyị, nʼihi na anyị na-agbaghara onye ọbụla mehiere megide anyị. Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa.’ ”
LUK 11:5 Ọ sịrị ha, “Onye nʼime unu nwere enyi, ga-agakwuru ya nʼetiti abalị sị ya, ‘Enyi m, biko gbazinye m ogbe achịcha atọ,
LUK 11:6 nʼihi na otu enyi m bịara nʼụlọ m, ma enweghị m nri ọbụla nʼụlọ m nke m ga-enye ya.’
LUK 11:7 Ma ọ ga-esi nʼime ụlọ zaghachi sị, ‘Enyela m nsogbu, emechiela m ụzọ, mụ na ụmụ m alakpuola, enweghị m ike ibili ugbu a inye gị ihe ọbụla.’
LUK 11:8 Agwa m unu, ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ enyi ya, kama nʼihi nsogbu ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa.
LUK 11:9 “Ya mere, agwa m unu, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka, a ga-emeghekwara unu ụzọ.
LUK 11:10 Nʼihi na onye na-arịọ na-arịọta, onye na-achọ na-achọta, onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.
LUK 11:11 “Onye nʼime unu bụ nna, ka nwa ya ga-arịọ ya azụ, o nye ya agwọ?
LUK 11:12 Maọbụ rịọọ ya akwa, ọ ga-enye ya akpị?
LUK 11:13 Ọ bụrụ na unu bụ ndị ọjọọ, maara otu esi enye ụmụ unu onyinye dị mma, karịa nke a, Nna unu nke bi nʼeluigwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya.”
LUK 11:14 Otu mgbe, ọ na-achụpụ mmụọ ọjọọ nke dara ogbi, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ pụrụ, onye ogbi ahụ kwuru okwu. Nke a juru igwe mmadụ ahụ anya.
LUK 11:15 Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Ọ bụ site nʼike Belzebub eze ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.”
LUK 11:16 Ndị ọzọ, iji nwalee ya, sị ya gosi ha ihe ịrịbama nke si nʼeluigwe.
LUK 11:17 Ma ebe ọ bụ na ọ maara ihe ha na-eche, ọ sịrị ha, “Alaeze ọbụla kewaranụ megide ibe ya, ga-atọgbọrọ nʼefu, ezinaụlọ ọbụla nke kewakwara megide ibe ya ga-adakpọ.
LUK 11:18 Ọ bụrụ na ekwensu ekewa megide onwe ya, alaeze ya ọ ga-esi aṅaa guzosie ike? Unu na-asị na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike Belzebub.
LUK 11:19 Ugbu a, ọ bụrụ na m sitere nʼike Belzebub na-achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ bụ site nʼike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ya mere, ha ga-abụ ndị ikpe unu.
LUK 11:20 Ma ọ bụrụ na m ji ike mkpịsịaka Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, mgbe ahụ alaeze Chineke abịarutela nʼebe unu nọ.
LUK 11:21 “Mgbe nwoke siri ike ji ngwa agha chekwa obi ya, ihe o nwere ga-adịgidere ya nʼudo.
LUK 11:22 Ma ọ bụrụ na onye ọzọ ka ya ike alụso ya ọgụ merie ya, ọ ga-anara ya ngwa agha niile bụ ihe ntụkwasị obi ya, kesakwaa ihe ọ kwatara nʼụlọ dike ahụ.
LUK 11:23 “Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa.
LUK 11:24 “Mgbe ọbụla mmụọ na-adịghị ọcha sị nʼime mmadụ pụọ, ọ na-ejegharị nʼala kpọrọ nkụ na-achọgharị ebe izuike. Ọ bụrụ na ọ chọtaghị ya, mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m hapụrụ.’
LUK 11:25 Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-achọpụta na a zachaala ya dozie ya nke ọma.
LUK 11:26 Mgbe ahụ, ọ ga-apụ ga chọta mmụọ ọjọọ asaa ọzọ ndị dị njọ karịa ya. Ha niile na-abata biri nʼime onye ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.”
LUK 11:27 Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.”
LUK 11:28 Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”
LUK 11:29 Dị ka igwe mmadụ ahụ na-amụba, o bidoro na-ekwu sị, “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ. Ọ na-achọ ihe ịrịbama ma ọ dịghị ihe ịrịbama a ga-ezi ya karịa ihe ịrịbama Jona.
LUK 11:30 Nʼihi na dị ka Jona si bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Ninive, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi bụrụkwa ihe ama nye ọgbọ a.
LUK 11:31 Nʼụbọchị ahụ, eze nwanyị ndị ndịda ga-ebili soro ndị ọgbọ a guzo nʼikpe, maa ha ikpe, nʼihi na o sitere na nsọtụ nke ụwa bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn, ma lee, onye karịrị Solomọn nọ nʼebe a.
LUK 11:32 Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe, nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona, ma lee, onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a.”
LUK 11:33 “Ọ dịghị onye na-amụnye oriọna dọnye ya nʼebe zoro ezo maọbụ nʼokpuru efere, kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ.
LUK 11:34 Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụ na anya gị dị mma, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè. Ọ bụrụkwanụ na anya gị dị njọ, ị ga-anọ nʼọchịchịrị.
LUK 11:35 Ya mere, lezie anya ka ị mara ka ìhè dị nʼime gị, ọ bụghị ọchịchịrị.
LUK 11:36 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ahụ gị niile ejupụta nʼìhè, ọ bụrụkwa na akụkụ ọbụla agbaghị ọchịchịrị, mgbe ahụ, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè dị ka mgbe ìhè oriọna na-achakwasị gị nʼahụ.”
LUK 11:37 Mgbe ọ na-ekwu okwu, otu onye Farisii kpọrọ ya ka ọ bịa soro ya rie nri. Ọ banyere nọrọ nʼoche nri.
LUK 11:38 O juru onye Farisii ahụ anya na mgbe ọ bidoro iri nri ọ kwọghị aka ya tupu ya ebido.
LUK 11:39 Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Unu ndị Farisii na-asacha azụ iko mmiri na efere, mee ka ọ dị ọcha, ma ime unu jupụtara nʼanya ukwu na nʼihe ọjọọ dị iche iche.
LUK 11:40 Ndị nzuzu! Ọ bụ na ọ bụghị onye ahụ mere azụ iko mekwara ime ya?
LUK 11:41 Kama werenụ ihe ndị ahụ dị nʼime rụọ ọrụ ebere, ihe niile ga-adịkwara unu ọcha.
LUK 11:42 “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii, nʼihi na unu na-enye otu ụzọ nʼụzọ iri nʼihi mint, na mkpa akwụkwọ na-esi isi ụtọna mkpa akwụkwọ niile dị iche iche nke ubi, ma leghara ikpe ziri ezi na ịhụnanya nke Chineke anya. Ihe niile ndị a ka unu kwesiri ime nʼelegharaghị ihe ndị ọzọ anya.
LUK 11:43 “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii! Nʼihi na unu na-ahụ ịnọ nʼisi oche niile nʼụlọ ekpere na ekele pụrụ iche a na-ekele unu nʼọma ahịa nʼanya.
LUK 11:44 “Ahụhụ ga-adịrị unu, nʼihi na unu dị ka ili na-apụtaghị ihe, nke ndị mmadụ na-agafe nʼelu ha nʼihi na ha amaghị na ọ bụ ili.”
LUK 11:45 Nʼotu oge, otu onye ozizi iwu sịrị ya, “Onye ozizi, mgbe ị na-ekwu ihe ndị a, anyị sokwa na ndị ị na-akọcha.”
LUK 11:46 Ma ọ sịrị, “Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu. Nʼihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu ha na-enweghị ike ibuli, ma unu onwe unu adịghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka unu, ịmetụ ibu ahụ aka.
LUK 11:47 “Ahụhụ ga-adịrị unu nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma bụ ndị nna nna unu ha gburu.
LUK 11:48 Ya mere, unu bụ ndị akaebe ma kwenyekwa nʼihe ndị nna nna unu ha mere, nʼihi ha gburu ha, ma unu e wuo ili ha.
LUK 11:49 Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke nʼamamihe ya ji kwuo sị, Aga m ezigara ha ndị amụma na ndị ozi, ụfọdụ ka ha ga-egbu ma ndị ọzọkwa ka ha ga-akpagbu.
LUK 11:50 Nʼihi nke a, ọgbọ a ga-aza ajụjụ banyere ọbara ndị amụma niile a wufuru, site na mmalite nke ụwa,
LUK 11:51 site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya, onye e gburu nʼetiti ebe ịchụ aja na ebe nsọ. E, agwa m unu, a ga-ajụ ihe banyere ha nʼaka ọgbọ a.
LUK 11:52 “Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu, nʼihi na unu wepụrụ ọtụghe igodo nke amamihe. Unu onwe unu abanyeghị, ma unu gbochikwara ndị na-abata ịbata.”
LUK 11:53 Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, ndị ode akwụkwọ na ndị Farisii bidoro isogbu ya, na ịkpasu ya ikwu ọtụtụ okwu,
LUK 11:54 na-esiri ya ọnya, ka ha mara ma ọ ga-ekwuhie ọnụ, ka ha hụ ihe ha ga-eji jide ya.
LUK 12:1 Nʼoge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara, nke mere ka ha na-azọ ibe ha ụkwụ. O buuru ụzọ bido ịgwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kpacharanụ anya unu banyere ihe na-eko achịcha ndị Farisii, nke bụ ihu abụọ ha.
LUK 12:2 Nʼihi na ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe.
LUK 12:3 Ihe ọbụla unu kwuru nʼọchịchịrị, a ga-anụ ya nʼihe, ihe ọbụla unu gbara nʼizu nʼime ụlọ ka a ga-ekwusa nʼelu ụlọ.
LUK 12:4 “Ana m agwa unu, ndị enyi m, unu atụla egwu maka ndị na-egbu anụ ahụ ma e mesịa, ha apụghị ime ihe ọzọ.
LUK 12:5 Ma aga m ezi unu onye unu ga-atụ egwu. Tụọnụ egwu Onye ahụ nwere ikike igbu anụ ahụ ma tụbakwa ya nʼọkụ ala mmụọ. E, asị m unu tụọnụ ya egwu.
LUK 12:6 Ọ bụghị mkpụrụ ego abụọ ka a na-ere ụmụ nza ise? Ma o nweghị nke ọbụla nʼime ha Chineke chefuru.
LUK 12:7 Nʼezie a gụrụ ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ọnụ. Unu atụla egwu, nʼihi na unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.
LUK 12:8 “Ma asị m unu, na onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, onye ahụ ka Nwa nke Mmadụ ga-ekwupụta nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke.
LUK 12:9 Onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, a ga-agọnarịkwa ya nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke.
LUK 12:10 Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya.
LUK 12:11 “Mgbe ha ga-akpọbata unu nʼihu ụlọ nzukọ, ndị ọchịchị na ndịisi, unu echegbula onwe unu otu unu ga-esi zaghachi, maọbụ ihe unu ga-aza, maọbụ ihe unu ga-ekwu.
LUK 12:12 Nʼihi na Mmụọ Nsọ ga-ezi unu nʼoge awa ahụ, ihe unu kwesiri ikwu.”
LUK 12:13 Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, gwa nwanne m nwoke ka o kenye m oke nʼihe nketa anyị.”
LUK 12:14 Ọ sịrị ya, “Nwoke, onye mere m onye ikpe maọbụ onye ndozi okwu nʼetiti unu?”
LUK 12:15 Ma ọ sịrị ha, “Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere.”
LUK 12:16 Ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu ọgaranya nwere ala mịrị nnọọ mkpụrụ dị ukwuu.
LUK 12:17 O chere nʼime onwe ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme nʼihi na enweghị m ebe m ga-echekwa mkpụrụ m?’
LUK 12:18 “Ya mere ọ sịrị, ‘Ihe m ga-eme bụ nke a, aga m akwatu ọba m, wuo nke ka ya ukwuu, bụ ebe m ga-echekwa mkpụrụ m na ihe ndị ọzọ.
LUK 12:19 Ya mere aga m agwa mkpụrụobi m, “I nwere ọtụtụ ezi ihe ga-ezuru gị ọtụtụ afọ, nʼihi ya zuru ike, rie, ṅụọ ma nweekwa obi ụtọ.” ’
LUK 12:20 “Ma Chineke gwara ya sị, ‘Onye nzuzu, nʼabalị a ka a ga-achọ mkpụrụobi gị nʼaka gị. Ihe niile ị kpakọtara nke onye ka ha ga-abụ?’
LUK 12:21 “Otu a ka ọ ga-adịrị onye ọbụla na-akpadoro naanị onwe ya akụ, ma ọ baghị ụba nʼebe Chineke nọ.”
LUK 12:22 Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ya mere, asị m unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi.
LUK 12:23 Nʼihi na ndụ dị mkpa karịa ihe oriri, anụ ahụ dịkwa mkpa karịa uwe.
LUK 12:24 Tuleenụ ugolọma. Ha adịghị akụ maọbụ ghọrọ mkpụrụ ọbụla. Ha enweghị ụlọakụ maọbụ ọba, ma Chineke na-azụ ha nri. Unu ọ dịghị oke ọnụahịa karịa anụ ufe ndị a.
LUK 12:25 Onye nʼime unu pụrụ itinye otu nkeji nʼogologo ụbọchị nke ndụ ya site nʼichegbu onwe ya?
LUK 12:26 Ebe unu na-apụghị ime ihe nta dị otu a, gịnị mere unu ji echegbu onwe unu banyere ihe ndị ọzọ?
LUK 12:27 “Tuleenụ otu okoko ọhịa lili si eto. Ha adịghị arụ ọrụ ọbụla maọbụ tụọ ogho. Ma asị m unu, ọ bụladị Solomọn nʼebube nke ịbụ eze ya niile, eyighị uwe ọbụla mara mma dị ka otu nʼime okoko osisi nke ọhịa ndị a.
LUK 12:28 Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ pụghị i si otu a chọọ unu mma karịa? Unu ndị okwukwe nta.
LUK 12:29 Ya mere, unu adọgbula onwe unu maka ihe unu ga-eri maọbụ ihe unu ga-aṅụ. Unu echegbukwala onwe unu.
LUK 12:30 Nʼihi na ọ bụ ihe ndị a ka ndị mba nke ụwa na-achụso, ma Nna unu makwara na ha dị unu mkpa.
LUK 12:31 Kama chọọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.
LUK 12:32 “Unu atụla egwu, igwe atụrụ nta, nʼihi na ọ tọrọ Nna unu ụtọ inye unu alaeze ahụ.
LUK 12:33 Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya.
LUK 12:34 Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.”
LUK 12:35 “Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu.
LUK 12:36 Dịnụ ka ndị ohu na-echere nlọghachi nke nna ha ukwu, onye gara oriri agbamakwụkwọ, bụ onye ha ga-emeghere ụzọ ngwangwa mgbe ọ lọtara kụọ aka.
LUK 12:37 Ndị ohu ahụ ga-abụ ndị a gọziri agọzi, bụ ndị onyenwe ha ga-ahụ na ha nọ na nche mgbe ọ ga-alọghachi. Nʼezie asị m unu na ọ ga-eke belịt ya nʼukwu ya, mekwa ka ha nọdụ ala na tebul iri ihe, ọ ga-abịakwa jere ha ozi.
LUK 12:38 Ngọzị ga-adịrị ndị ohu ahụ onye nwe ha ga-ahụ ka ha nọ na njikere, ọ bụladị ma ọ lọghachiri nʼetiti abalị, maọbụ nʼezigbo isi ụtụtụ.
LUK 12:39 Maranụ nke a: ọ bụrụ na onyenwe ụlọ maara oge awa onye ohi ga-eji abịa nʼụlọ ya, ọ gaghị ekwe ka onye ohi ahụ tiwaa ụlọ ya.
LUK 12:40 Unu kwesiri ịnọ na njikere nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.”
LUK 12:41 Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị tụrụ ilu a nʼihi anyị, ka ọ bụ maka onye ọbụla?”
LUK 12:42 Ma Onyenwe anyị sịrị, “Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ụmụodibo ya niile, ka ọ na-enye ha nri mgbe o kwesiri?
LUK 12:43 Ngọzị na-adịrị ohu ahụ nke onyenwe ya ga-ahụ ka ọ na-arụ ọrụ ahụ mgbe ọ ga-alọghachi.
LUK 12:44 Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme onye nke ahụ onyeisi nke ihe niile o nwere.
LUK 12:45 Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị nʼobi ya, ‘Onyenwe m na-anọ ọdụ ịlọta,’ ọ bụrụkwa na ọ malite itigbu ụmụodibo ndị ọzọ, bụ ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi, na iri ihe oriri, na ịṅụkwa ihe ọṅụṅụ na ịṅụbiga mmanya oke.
LUK 12:46 Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe.
LUK 12:47 “Ohu ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ma hapụ ịnọ na njikere, maọbụ ime ya, ka a ga-apịasi ụtarị ike.
LUK 12:48 Ma onye na-amaghị ama ma mee ihe kwesiri ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ụtarị ole na ole. Nʼihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nʼaka. Onye e nyekwara ihe ukwu nʼaka idebe, nʼaka ya ka a ga-achọ ihe nke kachasịnụ.
LUK 12:49 “A bịara m iwebata ọkụ nʼelu ụwa, ọ gaara adịrị m nọ mma ma ọ bụrụ na ọ malitelarị inwu!
LUK 12:50 Enwere m baptizim nke m na-aghaghị ime, ma aga m anọgide nʼoke ihe mgbu tutu e mezuo ya
LUK 12:51 Unu chere na m bịara iweta udo nʼụwa? Asị m unu mbaa, kama nkewa.
LUK 12:52 Site ugbu a gawa, mmadụ ise si nʼotu ezinaụlọ ga-ekewa megide onwe ha, atọ megide abụọ, abụọ megide atọ.
LUK 12:53 Ha ga-ekewa; nna megide nwa ya nwoke, nwa nwoke ga-emegidekwa nna ya, nne megide nwa ya nwanyị, nwa nwanyị megidekwa nne ya, nne di megide nwunye nwa ya, nwunye nwa megide nne di ya.”
LUK 12:54 Ọ gwakwara igwe mmadụ ahụ sị, “Mgbe unu hụrụ urukpu ojii ka ọ na-ebili nʼọdịda anyanwụ, unu na-eme ngwangwa sị, ‘Mmiri ga-ezo,’ ọ na-ezokwa.
LUK 12:55 Mgbe unu hụrụ na ifufe na-esite na ndịda na-efe, unu na-asị, Oke okpomọkụ ga-adị, ọ na-emekwa otu ahụ.
LUK 12:56 Ndị ihu abụọ! Unu matara ịkọwa ihu ala na mbara eluigwe. Gịnị mere unu apụghị ịkọwa oge dị ugbu a?
LUK 12:57 “Gịnị mere unu adịghị ekpebiri onwe unu ihe ziri ezi?
LUK 12:58 Ọ bụrụ na gị na onye na-ebo gị ebubo esoro na-aga nʼihu ọkaikpe, gbalịsie ike ka gị na ya kpezie nʼụzọ, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-akpọpụ gị nʼihu onye ọkaikpe, ma eleghị anya ọkaikpe ahụ ga-arara gị nye nʼaka ọkaikpe ukwu, ọkaikpe ukwu ga-ararakwa gị nye nʼaka onye na-eje ozi nʼụlọikpe, bụ onye ga-etinye gị nʼụlọ mkpọrọ.
LUK 12:59 Asị m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri ọ bụladị otu kobo nke ikpeazụ.”
LUK 13:1 Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ gwara ya banyere ndị Galili ahụ Pailet jiri ọbara ha gwakọta nʼaja ha chụrụ.
LUK 13:2 Ọ zara sị ha, “Unu chere na ndị Galili a tara ụdị ahụhụ a bụ ndị mmehie karịa ndị Galili niile?
LUK 13:3 Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-esi otu ahụ laa nʼiyi.
LUK 13:4 Ka unu chere na mmadụ iri na asatọ ahụ, ndị mgbidi aja ụlọ elu Sailọm dagburu bụ ndị ikpe mmehie mara karịa ndị niile bi na Jerusalem?
LUK 13:5 Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-ala nʼiyi dị ka ha.”
LUK 13:6 Ya mere, ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu nwoke kụrụ osisi fiig nʼubi vaịnị ya, ma mgbe ọ bịara chọọ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla.
LUK 13:7 Ya mere, ọ gwara onye ọrụ ubi ya sị, ‘Nʼime afọ atọ ndị a ka m bịara ka m ghọrọ mkpụrụ site nʼosisi fiig a, ma ahụghị m mkpụrụ ọbụla. Gbutuo ya! Gịnị mere ọ ga-eji na-erikọ nri dị nʼala ubi a?’
LUK 13:8 “Ọ zara sị ya, ‘Nna m ukwu, hapụkwa ya nʼafọ a, ka m gwuo ala gburugburu, hinye ya aja nri ala nʼukwu.
LUK 13:9 Ọ bụrụ na ọ mịa mkpụrụ nʼafọ ọzọ, ọ dị mma, ọ bụrụkwa na ọ mịghị, i nwere ike gbutuo ya. ’ ”
LUK 13:10 Nʼụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe.
LUK 13:11 Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara ị dị ya ike afọ iri na asatọ. Ọ na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem.
LUK 13:12 Mgbe Jisọs hụrụ ya, ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị.”
LUK 13:13 Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke.
LUK 13:14 Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nʼihi na Jisọs gwọrọ ọrịa nʼụbọchị izuike. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nʼime izu ụka mgbe mmadụ kwesiri ịrụ ọrụ. Ya mere, bịanụ ka a gwọọ unu nʼụbọchị ndị a, ọ bụghị nʼụbọchị izuike.”
LUK 13:15 Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Unu ndị ihu abụọ! Ọ dị onye nʼime unu na-adịghị atọpụ oke ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, site nʼụlọ anụmanụ, kpụpụ ya ebe ọ ga-aṅụ mmiri nʼụbọchị izuike?
LUK 13:16 O kwesighị ka a tọpụ nwanyị a bụ ada Ebraham nʼagbụ ekwensu kere ya ogologo afọ iri na asatọ, nʼụbọchị izuike, mee ka o nwere onwe ya?”
LUK 13:17 Mgbe o kwuru nke a, ihere mere ndị iro ya niile, ma ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọrụ ebube niile ọ na-arụ.
LUK 13:18 Ya mere, ọ na-ekwu sị, “Gịnị ka alaeze Chineke yiri? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya?
LUK 13:19 O yiri mkpụrụ mọstaadị nke mmadụ kụrụ nʼubi ya a gbara ogige. O toro ghọọ osisi, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.”
LUK 13:20 Ọzọ, ọ sịrị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke?
LUK 13:21 Ọ dị ka ihe na-eko achịchanke nwanyị gwakọtara na ọtụtụ atọ nke ụtụ ọka, tutu ruo mgbe o koro ụtụ ọka ahụ niile.”
LUK 13:22 O jegharịrị nʼobodo ukwu na nʼobodo nta niile na-ezi ihe, ka ọ na-aga Jerusalem.
LUK 13:23 Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?” Ọ sịrị ha,
LUK 13:24 “Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike.
LUK 13:25 Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’
LUK 13:26 “Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’
LUK 13:27 “Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’
LUK 13:28 “Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi.
LUK 13:29 Ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ, nakwa ọdịda anyanwụ, na nʼugwu na ndịda nke ụwa bịa nọdụ nʼoriri nʼime alaeze Chineke.
LUK 13:30 Ma lee, ndị bu ụzọ ga-aghọ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-aghọ ndị bu ụzọ.”
LUK 13:31 Nʼoge awa ahụ, ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya sị ya, “Si nʼebe a pụọ, nʼihi na Herọd na-achọ igbu gị.”
LUK 13:32 Ọ sịrị ha, “Gaa gwaranụ m nkịta ọhịa ahụ, lee, ana m achụpụ mmụọ ọjọọ, gwọọkwa ndị ọrịa taa na echi, ma nʼụbọchị nke atọ ka m ga-arụcha ọrụ m.
LUK 13:33 Ma otu ọ dị, aga m aga nʼihu nʼụzọ m taa, na echi na nwanne echi, nʼihi na nʼezie, ọ dịghị onye amụma ga-anwụ nʼebe ọzọ na-abụghị na Jerusalem.
LUK 13:34 “O Jerusalem! Jerusalem! Gị onye na-egbu ndị amụma ma na-ejikwa nkume atụgbu ndị e ziteere gị. Ọtụtụ mgbe ka m gbalịrị ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ sị achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya, ma unu ekweghị.
LUK 13:35 Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu. Ma agwa m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ ruo mgbe oge ahụ ga-abịa, mgbe unu ga-asị, ‘Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.’ ”
LUK 14:1 Otu ụbọchị izuike, mgbe ọ gara iri ihe nʼụlọ otu onyendu ndị Farisii, ha nọ na-ele ya anya nke ọma.
LUK 14:2 Ma lee, otu nwoke ahụ ya zara aza nọkwa nʼihu ya ebe ahụ.
LUK 14:3 Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ ọrịa nʼụbọchị izuike ka ọ bụ na o zighị?”
LUK 14:4 Ma ha e kwughị okwu ọbụla. Ya mere ọ kpọrọ ya, gwọọ ya ma sị ya laa.
LUK 14:5 Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na otu nʼime unu nwere nwa nwoke maọbụ oke ehi nke dabara nʼime olulu mmiri nʼụbọchị izuike, ọ bụ na ọ gaghị eme ngwangwa dọpụta ya?”
LUK 14:6 Ma ha enweghị ike ịza ajụjụ a.
LUK 14:7 Mgbe ọ hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri si họrọ naanị oche ndị a na-asọpụrụ, oche ndị a na-asọpụrụ, ọ tụrụ ha ilu sị,
LUK 14:8 “Mgbe mmadụ ọbụla kpọrọ gị oriri nʼọlụlụ di na nwunye, abatala nọdụ nʼoche ndị a na-asọpụrụ, nʼihi na eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara onye ka gị nwe nsọpụrụ.
LUK 14:9 Nʼihi na onye ahụ kpọrọ unu oriri nwere ike bịakwute gị sị gị, nye nwoke a ọnọdụ gị. Mgbe ahụ, ị ga-ebili nʼanya ihere gaa nọdụ nʼoche dịkarịsịrị ala.
LUK 14:10 Ma mgbe a kpọrọ gị, nọdụ nʼoche dị ala, ka ọ ga-abụ na onye kpọrọ gị oriri bịa, ọ ga-asị gị ‘Enyi m, rigota nʼebe a ka elu.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwekwa ugwu nʼanya ndị niile a kpọrọ gị na ha oriri.
LUK 14:11 Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”
LUK 14:12 Ọ gwara onye ahụ kpọrọ ya oriri sị, “Mgbe ị na-akpọ oriri nke nri ehihie maọbụ nke nri anyasị, akpọla naanị ndị enyi gị maọbụ ụmụnne gị ndị nwoke maọbụ ndị ikwu na ibe gị, maọbụ ndị agbataobi gị bara ọgaranya, nʼihi ma eleghị anya, ha pụrụ ịkpọkwa gị na mgbe nke ha, sị otu a kwụghachi gị ụgwọ.
LUK 14:13 Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye na ndị ọlụsị na ndị ngwụrọ na ndị ìsì.
LUK 14:14 A ga-agọzikwa gị, nʼihi na ha enweghị ike ịkwụghachi gị, a ga-akwụghachikwa gị mgbe ndị ezi omume ga-ebili nʼọnwụ.”
LUK 14:15 Mgbe otu nʼime ndị a kpọrọ oriri nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Ngọzị ga-adịrị onye ga-eso rie oriri nʼalaeze Chineke.”
LUK 14:16 Ma ọ sịrị ya, “Otu onye na-akwado oke oriri kpọkwa ọtụtụ mmadụ oku.
LUK 14:17 Mgbe oge oriri ahụ ruru, o zipụrụ ohu ya ka ọ ga gwa ndị ahụ ọ kpọrọ sị, ‘Bịanụ, nʼihi na e dozichaala ihe niile.’
LUK 14:18 “Ma ha niile nʼotu nʼotu malitere inye ọsịsa. Onye nke mbụ sịrị, ‘Azụrụ m iberibe ala ọhụrụ, ọ dịkwa mkpa na m ga-eje hụ ya, biko gbaghara m, agaghị m abịa.’
LUK 14:19 “Onye nke ọzọ sịrị, ‘Azụrụ m ehi e ji arụ ọrụ ubi, iri e jikọrọ abụọ abụọ. Ana m aga ugbu a ka m nwalee ha, biko gbaghara m, agaghị m abịa.’
LUK 14:20 “Ma onye ọzọ sịkwara, ‘Alụrụ m nwunye ọhụrụ, nʼihi nke a agaghị m abịa.’
LUK 14:21 “Ohu ahụ lọtara, kọọrọ nna ya ukwu ihe ndị ahụ a kpọrọ oriri kwuru. Mgbe ahụ, iwe dị ukwuu were nna ya ukwu, nke a mere ka o zipụ ohu ya sị ya, ‘Gaa ngwangwa nʼokporoụzọ ukwu na nʼokporoụzọ nta dị nʼobodo a, kpọbata ndị ogbenye, na ndị ụkwụ rụrụ, na ndị ìsì na ndị ngwụrọ.’
LUK 14:22 “Ohu ahụ sịrị, ‘Nna m ukwu, emeela m ihe i kwuru, ma ohere ka fọdụrụ.’
LUK 14:23 “Nna ukwu ahụ sịrị ohu ahụ, ‘Gaakwa nʼokporoụzọ ukwu na okporoụzọ nta, mee ka ndị mmadụ bata nʼụlọ m, ka ụlọ m jupụta na mmadụ.
LUK 14:24 Nʼihi na agwa m unu, ọ dịghị otu onye nʼime ndị ahụ a kpọrọ oriri ga-edetụ nri m ọnụ.’ ”
LUK 14:25 Ugbu a, oke igwe mmadụ na-eso ya ma ọ tụgharịrị sị ha:
LUK 14:26 “Onye ọbụla chọrọ iso m, ma o bụghị ụzọ kpọ nne na nna ya, na nwunye ya, na ụmụ ya, na ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị tinyekwara ndụ nke ya onwe ya asị, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.
LUK 14:27 Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, enweghị ike ịbụ onye na-eso ụzọ m.
LUK 14:28 “Ọ dị onye ọbụla nʼime unu chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, gbakọọ ihe ọ ga-efu ya, iji chọpụta ma o nwekwara ego ga-ezu iwucha ya?
LUK 14:29 Nʼihi na ọ bụrụ na ọ tọọ ntọala ma o nwekwaghị ike wuchaa ya, onye ọbụla hụrụ ya ga-achị ya ọchị,
LUK 14:30 na-asị, ‘Nwoke a malitere iwu ụlọ, ma o nweghị ike wuchaa ya.’
LUK 14:31 “Maọbụ olee eze chọrọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị ebu ụzọ nọdụ ala tulee ma puku ndị agha iri ya ọ ga-ezuru ya iji lụso onye ji iri puku ndị agha abụọ abịakwute ya ọgụ?
LUK 14:32 Ọ bụrụ na o nweghị ike, ọ ga-ezipụ ozi rịọ ka e kpee udo mgbe onye nke ọzọ ka nọ nʼebe dị anya.
LUK 14:33 Nʼụzọ dị otu a, onye ọbụla na-ajụghị ihe niile o nwere, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.
LUK 14:34 “Nnu dị mma, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ?
LUK 14:35 Ọ bakwaghị uru nye ala maọbụ iji mee nri ala. Kama ọ bụ itufu ya. “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
LUK 15:1 Ugbu a, ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-abịa ya nso ịnụta ihe ọ na-ekwu.
LUK 15:2 Ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-asị, “Nwoke a na-anabata ndị mmehie sorokwa ha na-eri nri.”
LUK 15:3 Ya mere, ọ tụrụ ha ilu a sị,
LUK 15:4 “Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu enwee narị atụrụ ma otu nʼime ha akpafuo. Ọ bụ na ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu ahụ fọdụrụ nʼọzara, pụọ ịchọgharị otu ahụ kpafuru ruo mgbe ọ chọtara ya?
LUK 15:5 Mgbe ọ chọtara ya, ọ ga-eji ọṅụ tụkwasị ya nʼubu ya.
LUK 15:6 Mgbe ọ lọtara nʼụlọ ya, ọ ga-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m atụrụ m furu efu.’
LUK 15:7 Asị m unu, nʼụzọ dị otu a, ọṅụ dị ukwu ga-adị nʼeluigwe nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa iri itoolu na itoolu ndị ezi omume bụ ndị nchegharị na-adịghị mkpa.
LUK 15:8 “Maọbụ olee nwanyị nke nwere mkpụrụ ọlaọcha iri, ọ bụrụ nʼotu nʼime ha adafuo. Ọ gaghị amụnye oriọna, zaa ime ụlọ ya ịchọ otu mkpụrụ ego ahụ tutu ọ chọta ya?
LUK 15:9 Mgbe ọ chọtara otu mkpụrụ ego ahụ, ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m ego m furu efu.’
LUK 15:10 Nʼụzọ dị otu a, asị m unu, ọṅụ ga-adị nʼihu ndị mmụọ ozi Chineke nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị.”
LUK 15:11 O kwukwaara sị, “Otu nwoke mụtara ụmụ nwoke abụọ.
LUK 15:12 Nwa ya nke nta sịrị nna ya, ‘Nna, kenye m oke ruuru m nʼihe niile i nwere.’ Ya mere, o kenyere ya oke nke ya site nʼihe o nwere.
LUK 15:13 “Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, nwokorobịa ahụ kwakọtara ihe niile o nwere gaa biri nʼotu obodo dị anya. Nʼebe ahụ, o mefuchara ihe niile o nwere nʼibi ndụ ọjọọ.
LUK 15:14 Mgbe o mefuchara ihe niile o nwere, oke ụnwụ dara nʼala ahụ. Ọ malitere ịnọ nʼụkọ.
LUK 15:15 Nʼihi nke a, ọ gara binyere otu onye obodo ahụ nyere ya ọrụ ilekọta ezi ya na inye ha nri.
LUK 15:16 Ma ọ na-agụ ya ka o site na nri ọ na-enye ezi rijuo afọ, ma ọ dịghị onye nyere ya ụdị nri ahụ.
LUK 15:17 “Mgbe ọ ghọtara onwe ya, ọ sịrị, ‘Mmadụ ole bụ ndị ọrụ e goro ego nna m nwere, ndị nri na-ezuru ma mapụtakwa, ma agụụ na-egbu m nʼebe a.
LUK 15:18 Aga m ebili lakwuru nna m, sị ya, Nna, emehiela m megide eluigwe na gị onwe gị.
LUK 15:19 Ekwesikwaghị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ, were m dị ka otu nʼime ndị i goro ọrụ.’
LUK 15:20 Ya mere, o biliri laghachikwuru nna ya. “Ma mgbe ọ nọrịị nʼebe dị anya, nna ya hụrụ ya, nwee ọmịiko nʼahụ ya, gbaara ọsọ ga makụọ ya, sutukwa ya ọnụ.
LUK 15:21 “Nwa ya nwoke ahụ sịrị ya, ‘Nna, emehiela m megide eluigwe na gị onwe gị. Ekwesighị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ.’
LUK 15:22 “Ma nna ya gwara ndị ohu ya sị, ‘Meenụ ngwangwa weta uwe kachasị mma yikwasị ya. Gbanye ya ọlaaka nʼaka, yinyekwanụ ya akpụkpọụkwụ nʼụkwụ.
LUK 15:23 Gaanụ kpụpụta nwa ehi gbara abụba, gbuo ya, ka anyị rie ma ṅụrịakwa.
LUK 15:24 Nʼihi na nwa m a, nwụrụ anwụ ma ọ dịla ndụ ọzọ. O fukwara efu ma a chọtala ya.’ Ha bidoro na-eri, na-aṅụ na-aṅụrịkwa ọṅụ.
LUK 15:25 “Ọ dịghị anya, nwa ya nke okenye, onye jere ịrụ ọrụ nʼubi, mgbe ọ na-abịaru ụlọ nso, ọ nụrụ ụda egwu na ịgba egwu.
LUK 15:26 Ọ kpọrọ otu nʼime ndị ohu jụọ ya ihe na-eme.
LUK 15:27 Ọ sịrị ya, ‘Nwanne gị nwoke alọtala. Nna gị egbuola nwa ehi gbara abụba nʼihi na ọ lọtara nʼudo na ahụ ike.’
LUK 15:28 “Iwe were ya, ọ jụrụ ịbata nʼime ụlọ. Nna ya pụtara nʼezi rịọ ya arịrịọ.
LUK 15:29 Ma ọ zara nna ya sị, ‘Lee ọtụtụ afọ niile ndị a ka m nọọ na-ejere gị ozi, enupukwaghị m isi nʼiwu gị nʼụzọ ọbụla. Ma o nweghị oge i nyere m ọ bụladị nwa ewu sị mụ na ndị enyi m jiri ya mee oriri.
LUK 15:30 Ma ugbu a, nwa gị a, onye ya na ndị akwụna mefuru akụ gị alọtala, ya ka i gburu nwa ehi gbara abụba.’
LUK 15:31 “Ma ọ sịrị ya, ‘Nwa m, mụ na gị nọ mgbe niile, ihe niile m nwere bụkwa nke gị.
LUK 15:32 Ma anyị kwesiri ịṅụrị ọṅụ, kpọọkwa oriri, nʼihi na nwanne gị nwoke a nwụrụ anwụ ma ọ dịla ndụ ọzọ. O fukwara efu ma a chọtala ya. ’ ”
LUK 16:1 Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu ọgaranya nwere otu onyeisi ọrụ nke e boro ebubo na ọ na-ala akụ ya nʼiyi.
LUK 16:2 Ya mere ọ kpọrọ ya sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị? Gbakọọrọ m otu i si na-elekọta akụ m, nʼihi na achọkwaghị m ka ị bụrụ onyeisi ọrụ ọzọ.’
LUK 16:3 “Onyeisi ọrụ ahụ sịrị onwe ya, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a nna m ukwu na-achọ ịkwụsị m ọrụ? Ike igwu ala adịghị m, ihere agakwaghị ekwe m ịrịọ arịrịọ.
LUK 16:4 Amatala m ihe m ga-eme, nke a ga-enyere m aka ma ọ bụrụ na a chụpụ m nʼọrụ nʼebe a, aga m enweta ndị ga-anabata m nʼụlọ ha.’
LUK 16:5 “Ya mere ọ kpọrọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ nʼotu nʼotu. Ọ jụrụ onye nke mbụ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji nna m ukwu?’
LUK 16:6 “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ puku karama mmanụ oliv ka m ji ụgwọ ya.’ “Onyeisi ọrụ ahụ gwara ya sị, ‘Ngwangwa, were akwụkwọ degharịa ya narị karama ise.’
LUK 16:7 “Mgbe ahụ, ọ jụrụ onye nke abụọ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji?’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ narị akpa ọka wiiti.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ngwangwa degharịa ya iri akpa ọka wiiti asatọ.’
LUK 16:8 “Nna ya ukwu toro onyeisi ọrụ ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihi na ọ kpara agwa dị ka onye nwere uche. Nʼihi na ụmụ, nke ọgbọ a, ji akọnuche na-eso ndị ọgbọ ha karịa ụmụ nke ìhè.
LUK 16:9 Agwa m unu, jirinụ akụnụba nke ajọ omume metara onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ na mgbe ọ na-adịghịkwa akụ unu nwere, ha ga-anabata unu nʼụlọ obibi ha ebighị ebi.
LUK 16:10 “Onye ọbụla kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, ga-ekwesikwa ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu. Onye na-ekwesikwaghị ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, agaghịkwa ekwesi ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu.
LUK 16:11 Ọ bụrụ na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ mmehie nke ụwa, onye ga-enyekwa ezi akụ nʼaka unu na ntụkwasị obi idebe?
LUK 16:12 Ọ bụrụkwa na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ onye ọzọ, onye ga-enye unu ihe nke bụ nke unu?
LUK 16:13 “Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ, sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.”
LUK 16:14 Mgbe ndị Farisii, bụ ndị hụrụ ego nʼanya nụrụ ihe ndị a, ha jiri ya mee ihe ọchị.
LUK 16:15 Ọ sịrị ha, “Unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume nʼihu ndị mmadụ ma Chineke maara obi unu. Nʼihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị oke mkpa bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Chineke.
LUK 16:16 “Iwu na ndị amụma nọ na-achị ruo oge Jọn bịara. Site nʼoge ahụ, a na-ekwusa oziọma nke alaeze Chineke, onye ọbụla na-ejikwa ike na-abanye nʼime ya.
LUK 16:17 Ọ dị mfe ka eluigwe na ụwa gabiga karịa na a ga-ewepụ otu kpọm, site nʼihe niile dị nʼiwu.
LUK 16:18 “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko. Onye ọ bụlakwa lụrụ nwanyị di ya jụrụ na-eme mmehie ịkwa iko.
LUK 16:19 “Ọ dị otu ọgaranya na-eyi uwe odo odo na ezi akwa ọcha, na-erikwa nri dị mma ụbọchị niile.
LUK 16:20 Nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, otu nwoke onye ogbenye nke ọnya juru ahụ ya na-edina nʼebe ahụ. Aha ya bụ Lazarọs.
LUK 16:21 Ọ na-agụsị ya agụụ ike iri iberibe nri si na tebul ọgaranya ahụ daa nʼala. Ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa na-aracha ọnya dị ya nʼahụ.
LUK 16:22 “Mgbe onye ogbenye ahụ nwụrụ, ndị mmụọ ozi bịara buru ya gaa nʼebe Ebraham nọ. Onye ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya.
LUK 16:23 Nʼọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nʼoke ihe mgbu, ọ hụrụ Ebraham ka ọ nọ nʼebe dị anya, hụkwa Lazarọs nʼakụkụ ya.
LUK 16:24 Ọ kpọkuru Ebraham sị ya, ‘Nna m Ebraham, meere m ebere nʼihi na anọ m nʼoke ihe mgbu nʼime ọkụ a. Biko zienụ Lazarọs ka ọ denye mkpịsịaka ntakịrị ya na mmiri bịa mejụọ ire m.’
LUK 16:25 “Ma Ebraham sịrị ya, ‘Nwa m, chetakwa na ị nara ezi ihe gị mgbe ị dị ndụ, ebe Lazarọs nara ihe ọjọọ. Ma ugbu a, a na-akasị ya obi nʼebe a ma gị onwe gị nọkwa nʼahụhụ.
LUK 16:26 A sịkwarị na anyị achọọ inyere gị aka, ọ gaghị ekwe mee nʼihi na e nwere olulu dị ukwuu kewara anyị na unu. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike isite nʼebe a bịa nʼebe unu nọ, ọ dịkwaghị onye nwere ike isite nʼebe ahụ unu nọ bịa nʼebe a.’
LUK 16:27 “Ọ sịrị, ‘Ya mere, arịọ m gị nna, ziganụ ya nʼụlọ nna m,
LUK 16:28 nʼihi na enwere m ụmụnne nwoke ise. Ka ọ dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịbịa nʼebe a mmekpa ahụ dị.’
LUK 16:29 “Ebraham sịrị, ‘Ha nwere Mosis na ndị amụma, ha gee ha ntị.’
LUK 16:30 “Ma o kwuru, ‘Nna Ebraham, nke ahụ agaghị ezu! A sị na otu onye ga-esi nʼala ndị nwụrụ anwụ gakwuru ha, ha ga-echegharị.’
LUK 16:31 “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụrụ na ha egeghị Mosis na ndị amụma ntị, ha agaghị ekwenye ma a sịkwarị na mmadụ esi nʼọnwụ bilie.’ ”
LUK 17:1 Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Ihe ndị nke na-eme ka mmadụ jehie aghaghị ịdị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla ọnọdụ ndị a ga-esi nʼaka ya bịa.
LUK 17:2 Ọ ga-akara gị mma ka e kenye gị nkume igwe nri nʼolu, tụnye gị nʼime oke osimiri, karịa na ị ga-eduhie otu nʼime ụmụntakịrị ndị a ụzọ.
LUK 17:3 Kpachapụrụnụ onwe unu anya! “Ọ bụrụ na nwanna gị e mejọọ gị, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya.
LUK 17:4 Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugboro asaa nʼotu ụbọchị, rịọkwa gị ugboro asaa sị, ‘E chegharịala m,’ ị ghaghị ịgbaghara ya.”
LUK 17:5 Ndị ozi ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, mee ka okwukwe anyị dị ukwuu!”
LUK 17:6 Onyenwe anyị zara, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ha ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị osisi ukwu a, Ka e site na mgbọrọgwụ hopu gị ma kụọkwa gị nʼime oke osimiri, ọ ga-erubere unu isi.
LUK 17:7 “Ọ bụ onye nʼime unu nke nwere ohu onye si ebe ọ gara rụọ ọrụ maọbụ ịzụ atụrụ lọbata, ga-asị ya, ‘Mee ngwangwa nọdụ ala rie nri’?
LUK 17:8 Ọ gaghị asị ya, ‘Siere m nri ọsịịsọ, kwadoo onwe gị jere m ozi ka m na-eri na aṅụkwa ihe ọṅụṅụ; emesịa ị ga-eri nri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ nke gị’?
LUK 17:9 Ọ ga-ekele ohu ahụ nʼihi na ọ rụrụ ọrụ o kwesiri ịrụ?
LUK 17:10 Nʼotu aka ahụ, mgbe unu rụchara ọrụ niile unu kwesiri ịrụ, ihe unu ga-ekwu bụ, ‘Anyị bụ ụmụ ohu na-ekwesighị ekwesi, anyị emeela ihe anyị kwesiri ime.’ ”
LUK 17:11 Ka ọ na-aga Jerusalem, o sitere nʼụzọ dị nʼagbata Sameria na Galili.
LUK 17:12 Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya.
LUK 17:13 Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.”
LUK 17:14 Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha.
LUK 17:15 Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke.
LUK 17:16 Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria.
LUK 17:17 Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ?
LUK 17:18 Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?”
LUK 17:19 Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị.”
LUK 17:20 Ma mgbe ndị Farisii jụrụ ya sị, Olee mgbe alaeze Chineke ga-abịa? O kwuru, “Ọbịbịa alaeze Chineke agaghị a bụ nʼụzọ a ga-eji anya efu hụ ya.
LUK 17:21 Ha agaghịkwa asị, ‘Lee, ọ nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘nʼebe ahụ,’ nʼihi nʼezie, alaeze Chineke nọ nʼetiti unu. ”
LUK 17:22 Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Oge na-abịa mgbe ọ ga-agụsi unu agụụ ike ịhụ otu nʼime ụbọchị nke Nwa nke Mmadụ, ma unu agaghị ahụ ya.
LUK 17:23 Ha ga-asị unu, ‘Lee, nʼebe ahụ,’ maọbụ, ‘Lee, nʼebe a,’ unu agala, unu esokwala ha.
LUK 17:24 Nʼihi na Nwa nke Mmadụ nʼụbọchị ya ga-adị ka amụma nke eluigwe nke na-enye ìhè na mbara eluigwe site nʼotu ebe ruo nʼebe nke ọzọ.
LUK 17:25 Ma ọ ghaghị ibu ụzọ hụọ ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya.
LUK 17:26 “Dị ka ọ dị nʼụbọchị Noa, otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị Nwa nke Mmadụ.
LUK 17:27 Ha nọ na-eri na-aṅụ, na-alụ nwunye na-ekekwa ụmụ ha di, ruo mgbe Noa banyere nʼụgbọ mmiri. Oke iju mmiri ahụ bịakwara laa ha nʼiyi.
LUK 17:28 “Otu a ka ọ dịkwa nʼoge Lọt. Ha nọ na-eri, na-aṅụ, na-azụrịtakwa ahịa, na-akụ mkpụrụ, na-arụkwa ụlọ.
LUK 17:29 Ma nʼụbọchị ahụ Lọt si nʼobodo Sọdọm pụta, ọkụ na nkume dị ọkụ sitere nʼeluigwe zoo ka mmiri, laa ha niile nʼiyi.
LUK 17:30 “Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị a ga-eme ka Nwa nke Mmadụ pụta ìhè.
LUK 17:31 Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ, ma ihe ya dị nʼime ụlọ, arịtukwala ịba nʼime ụlọ iburu ngwongwo ndị ahụ. Nʼotu aka ahụ, onye ọbụla nọ nʼubi, ya ghara ịlọghachita.
LUK 17:32 Chetakwanụ nwunye Lọt.
LUK 17:33 Onye ọbụla chọrọ iche ndụ ya nche ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla na-atụfu ndụ ya ga-echebe ya.
LUK 17:34 Asị m unu, nʼanyasị ahụ mmadụ abụọ ga-edina nʼotu akwa, a ga-ewepụ otu nʼime ha hapụ onye nke ọzọ.
LUK 17:35 Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ ọka nʼotu ebe, a ga-ewere otu ma hapụ nke ọzọ.”
LUK 17:36 Ụmụ nwoke abụọ ga-anọ nʼubi, a ga-ewere otu onye hapụ nke ọzọ.
LUK 17:37 Ha jụrụ ya sị, “Olee ebe, Onyenwe anyị?” Ọ sịrị ha, “Ebe ọbụla ozu dị, ka udele na-ezukọta.”
LUK 18:1 Mgbe ahụ ọ tụụrụ ha ilu a iji gosi ha mkpa ọ dị ikpe ekpere na-esepụghị aka,
LUK 18:2 ọ sịrị, “O nwere otu ọkaikpe bi nʼotu obodo ma ọ naghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị asọpụkwara mmadụ.
LUK 18:3 Nʼobodo ahụkwa, e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ nke na-abịakwute ya, na-asị ya, ‘Kpepụta m nʼaka ndị na-emegide m.’
LUK 18:4 “Na mmalite, ọ chọghị, ma nʼikpeazụ, ọ gwara onwe ya sị, ‘Ọ bụ eziokwu na anaghị m atụ egwu Chineke maọbụ sọpụrụ mmadụ.
LUK 18:5 Ma nʼihi na nwanyị a di ya nwụrụ anwụ nọgidere na-enye m nsogbu, aga m ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka ọ kwụsị inye m nsogbu site na ọbịbịa ọ na-abịa.’ ”
LUK 18:6 Ya mere Onyenwe anyị sịrị, “Gerenụ ihe ọkaikpe nke na-eme ajọ omume na-ekwu.
LUK 18:7 Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ ọ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka?
LUK 18:8 Asị m unu, ọ ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu ọ dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?”
LUK 18:9 Ọ tụkwara ilu a nʼihi ndị tụkwasịrị obi nʼonwe ha na ha bụ ndị ezi omume ma na-eleda ndị ọzọ anya.
LUK 18:10 “Ụmụ nwoke abụọ rigoro nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere, otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, onye nke ọzọ bụ onye ọna ụtụ.
LUK 18:11 Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ kpee ekpere banyere onwe ya sị, ‘Chineke nna m, ana m ekele gị nʼihi na adịghị m ka mmadụ ndị ọzọ ndị na-apụnara mmadụ ihe ya nʼike, maọbụ ndị ajọ omume, maọbụ ndị na-akwa iko, ma ọ bụkwanụ dị ka onye ọna ụtụ a.
LUK 18:12 Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ nʼizu ụka ọbụla. Ana m akwụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’
LUK 18:13 “Ma onye ọna ụtụ ahụ guzo nʼebe dị anya, o nwekwaghị ike iweli ihu ya elu lee anya nʼeluigwe. Kama, ọ na-eti aka nʼobi ya na mwute na-asị, ‘Chineke, biko mere m ebere nʼihi na abụ m onye mmehie.’
LUK 18:14 “Asị m unu, na nwoke a lara nʼụlọ ya bụrụ onye a gụrụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke karịa onye nke ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”
LUK 18:15 Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha baara ha mba.
LUK 18:16 Ma Jisọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, sị, “Kweenụ ka ha bịakwute m, unu egbochikwala ha, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị ka ha.
LUK 18:17 Nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-agaghị anara alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.”
LUK 18:18 Otu onye ọchịchị jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi, ọ bụ gịnị ka m ga-eme keta ndụ ebighị ebi.”
LUK 18:19 Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke.
LUK 18:20 Ị maara ihe niile enyere nʼiwu, akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị.”
LUK 18:21 Ọ sịrị, “Edebezuchaala m iwu ndị a niile site na mgbe m bụ nwata.”
LUK 18:22 Mgbe Jisọs nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Otu ihe fọdụrụ ka ime: ree ihe niile i nwere, kesara ụmụ ogbenye ego ya. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, bịazie soro m.”
LUK 18:23 Mgbe ọ nụrụ nke a, o wutere ya nke ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye nwere ọtụtụ akụ.
LUK 18:24 Jisọs lere ya anya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe siri ike bụ ndị ọgaranya ịba nʼalaeze Chineke.
LUK 18:25 Nʼezie, ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.”
LUK 18:26 Ndị nụrụ ya sịrị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”
LUK 18:27 Ọ sịrị, “Ihe mmadụ na-apụghị ime, bụ ihe Chineke pụrụ ime.”
LUK 18:28 Mgbe ahụ Pita sịrị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile anyị nwere soro gị!”
LUK 18:29 Ọ sịrị ha, “Nʼezie, agwa m unu, o nweghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ nwunye, maọbụ ụmụnne, maọbụ ndị mụrụ ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, nʼihi alaeze Chineke
LUK 18:30 nke na-agaghị anata ihe ndị a nʼọgbọ a, nwekwa ndụ ebighị ebi nʼọgbọ nke na-abịa.”
LUK 18:31 Jisọs kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ, gwa ha sị, “Anyị na-aga Jerusalem, ihe niile ndị amụma dere banyere Nwa nke Mmadụ ga-emezu.
LUK 18:32 A ga-arara ya nyefee ya nʼaka ndị mba ọzọ. Ha ga-akwa ya emo, mee ya ihe ihere, bụkwaa ya ọnụ mmiri asụ.
LUK 18:33 Ha ga-apịa ya ihe, gbukwaa ya; ma nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie ọzọ.”
LUK 18:34 Ma ha aghọtaghị ihe ọbụla nʼokwu ndị a. E mere ka nkọwa okwu ndị a bụrụ ihe e zoro ezo nʼebe ha nọ, ha aghọtakwaghị ihe o kwuru.
LUK 18:35 O ruo ka ọ bịaruru Jeriko nso, otu nwoke kpuru ìsì nọ nʼakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ.
LUK 18:36 Mgbe ọ nụrụ uzu igwe mmadụ ka ha na-agafe, ọ jụrụ ihe na-eme.
LUK 18:37 Ha gwara ya, “Jisọs onye Nazaret na-agafe.”
LUK 18:38 O tiri mkpu sị, “Jisọs nwa Devid, meere m ebere!”
LUK 18:39 Ndị bu ụzọ baara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma o tisiri mkpu ike sị, “Nwa Devid, meere m ebere!”
LUK 18:40 Jisọs kwụsịrị, nye iwu ka a kpọtara ya nwoke ahụ. Mgbe o rutere nso, ọ jụrụ ya,
LUK 18:41 “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ sịrị, “Onyenwe anyị, ka e mee ka m hụ ụzọ ọzọ.”
LUK 18:42 Jisọs sịrị ya, “Hụ ụzọ, okwukwe gị agwọọla gị.”
LUK 18:43 Ngwangwa, o bidoro ịhụ ụzọ ma soro Jisọs, na-etokwa Chineke. Ndị mmadụ niile, mgbe ha hụrụ ya tokwara Chineke.
LUK 19:1 Ọ banyere Jeriko mgbe ọ na-agafe.
LUK 19:2 Otu nwoke nọ ebe ahụ, aha ya bụ Zakịọs; ọ bụ onyeisi ndị ọna ụtụ bụrụkwa ọgaranya.
LUK 19:3 Ọ chọrọ ịhụ onye Jisọs bụ ma ebe ọ bụ onye mkpụmkpụ, ọ dịrịghị ya mfe nʼihi igwe mmadụ.
LUK 19:4 Ya mere, ọ gbaara ọsọ gaa nʼihu rigoro nʼotu osisi sikamọ, ka o nwee ike ịhụ ya dị ka ọ na-agafe nʼụzọ ahụ.
LUK 19:5 Mgbe Jisọs rutere nʼebe ahụ, o lere anya nʼelu sị ya, “Zakịọs, rịdata ngwangwa. Aga m abụ ọbịa nʼụlọ gị taa.”
LUK 19:6 Ọ rịdatara nʼotu mgbe ahụ jirikwa obi ụtọ nabata ya.
LUK 19:7 Mmadụ niile hụrụ nke a, ma bido na-atamu sị, “Ọ gaala ịbụ ọbịa onye mmehie.”
LUK 19:8 Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, “Lee, Onyenwe anyị, aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile m nwere. Ọ bụrụkwa na o nwere onye m ghọgburu nara ya ihe ọbụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.”
LUK 19:9 Jisọs gwara ya, “Taa nzọpụta abịala nʼụlọ a, nʼihi na onye a bụkwa nwa Ebraham.
LUK 19:10 Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu.”
LUK 19:11 Dị ka ha na-ege ya ntị nʼokwu a, ọ gara nʼihu tụọrọ ha ilu, nʼihi na ọ nọ Jerusalem nso, ha chekwara na o ruola mgbe alaeze Chineke ga-apụta ihe.
LUK 19:12 Ọ sịrị, “Otu nwoke a mụrụ nʼọnọdụ dị elu gara obodo dị anya ka echie ya eze, ka ọ lọtakwa ma e mesịa.
LUK 19:13 Ya mere, ọ kpọrọ ndị ohu ya iri nye ha mkpụrụ ego iri sị ha, ‘Werenụ ego ndị a zụọ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’
LUK 19:14 “Ma ndị ọ na-achị kpọrọ ya asị, ha zipụkwara ndị ụkwụ ozi nʼazụ ya na-asị, ‘Anyị achọkwaghị ka onye a chịa anyị.’
LUK 19:15 “Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru.
LUK 19:16 “Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’
LUK 19:17 “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’
LUK 19:18 “Onye nke abụọ bịara sịkwa, ‘Onyenwe m, otu mkpụrụ ego gị amụtala mkpụrụ ego ise ọzọ.’
LUK 19:19 “Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’
LUK 19:20 “Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya.
LUK 19:21 Atụrụ m egwu gị, nʼihi na ị bụ onye afọ tara mmiri, bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’
LUK 19:22 “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ okwu si gị nʼọnụ ka m ga-eji kpee gị ikpe, gị bụ ohu ọjọọ! I maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị?
LUK 19:23 Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’
LUK 19:24 “Mgbe ahụ, ọ gwara ndị guzo nʼebe ahụ, ‘Napụtanụ ya mkpụrụ ego ahụ, were ya nye onye ji mkpụrụ ego iri.’
LUK 19:25 “Ha sịrị ya, ‘Nna anyị ukwu, o nwelarị mkpụrụ ego iri.’
LUK 19:26 “Ọ zara, ‘Asị m unu, onye ọbụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere.
LUK 19:27 Ma ndị iro m ahụ, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụpụtanụ ha nʼebe a, gbukwaanụ ha nʼihu m.’ ”
LUK 19:28 Mgbe ọ kwusiri nke a, ọ gakwara nʼihu nʼije ya ịga Jerusalem.
LUK 19:29 Mgbe ọ na-abịaru Betfeji na Betani nso, nʼUgwu a na-akpọ Oliv, Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya,
LUK 19:30 sị, “Gaanụ nʼime obodo nta ahụ dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kenyere nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-anọkwasịbeghi nʼelu ya, tọpụnụ ya, kpụtara m ya.
LUK 19:31 Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ unu, ‘Gịnị mere unu ji atọpụ ya?’ Gwanụ onye ahụ sị, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.’ ”
LUK 19:32 Ndị ahụ o zipụrụ gara hụ ya dị ka ọ gwara ha.
LUK 19:33 Mgbe ha bidoro ịtọpụ ya, ndị nwe ya jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji atọpụ nwa ịnyịnya ahụ?”
LUK 19:34 Ha sịrị, “Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.”
LUK 19:35 Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, nyere Jisọs aka ka ọ rigoro nʼelu ya.
LUK 19:36 Dị ka ọ na-aga, ndị mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ.
LUK 19:37 Mgbe o rutere nʼụzọ e si arịgo Ugwu Oliv, igwe mmadụ ndị ahụ na-eso ụzọ ya malite iji ọṅụ na-eto Chineke nʼoke olu nʼihi ọrụ ebube niile ha hụrụ,
LUK 19:38 na-asị, “Onye a gọziri agọzi ka eze ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.” “Udo nʼeluigwe, ebube dịkwa nʼebe kachasị elu.”
LUK 19:39 Ụfọdụ nʼime ndị Farisii so igwe mmadụ ahụ gwara ya, “Onye ozizi, gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha mechie ọnụ!”
LUK 19:40 Ọ zara sị, “Ka m gwa unu, ọ bụrụ na ha agbaa nkịtị, nkume ndị a ga-eti mkpu.”
LUK 19:41 Mgbe ọ rutere Jerusalem nso, ebe ọ nọ hụzie obodo ahụ anya nke ọma. Ọ bere akwa nʼihi ya,
LUK 19:42 sị, “Ọ bụrụ na ị maara taa, ọ bụladị gị onwe gị, ihe ndị na-eweta udo! Ma ugbu a, ezofuola ha nʼanya gị.
LUK 19:43 Oge na-abịa mgbe ndị iro gị ga-agba gị gburugburu, mechie ụzọ mgbapụ niile, sitekwa nʼụzọ niile dị iche iche bịakwasị gị.
LUK 19:44 Ha ga-egwepịa gị nʼala, gị na ụmụ gị nọ nʼime mgbidi a, ọ dịkwaghị nkume ọbụla ha ga-ahapụ nʼelu ibe ya, nʼihi na ị mataghị oge nleta Chineke nye gị.”
LUK 19:45 Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu bido ịchụpụ ndị nọ ebe ahụ na-ere ahịa.
LUK 19:46 Ọ sị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ ‘na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere’; ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.’ ”
LUK 19:47 Ụbọchị niile, ọ na-anọ na-akụzi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ma ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị ndu nʼetiti ndị mmadụ, nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya.
LUK 19:48 Ma ha achọtaghị ụzọ ọbụla ime ya, nʼihi na mmadụ niile sogidere ya kwenyekwara nʼokwu ya.
LUK 20:1 Otu ụbọchị, ka ọ nọ nʼụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe na-ekwusakwa oziọma. Ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị okenye bịakwutere ya.
LUK 20:2 Ha sịrị ya, “Gwa anyị, olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Onye nyekwara gị ikike a?”
LUK 20:3 Ọ zara ha sị, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Gwanụ m,
LUK 20:4 baptizim nke Jọn, o si nʼeluigwe ka o si nʼaka mmadụ?”
LUK 20:5 Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị na o sitere nʼeluigwe, ọ ga-asị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’
LUK 20:6 Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na, ‘o sitere nʼaka mmadụ,’ ndị mmadụ ga-atụ anyị nkume, nʼihi na ha niile kweere na Jọn bụ onye amụma.”
LUK 20:7 Ya mere, ha zara, “Anyị amaghị ebe o si bịa.”
LUK 20:8 Jisọs sịrị ha, “Enwekwaghị m ike ịgwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.”
LUK 20:9 Ọ gara nʼihu tụọrọ ndị mmadụ ilu a sị, “Otu nwoke nwere ubi vaịnị, nke o nyefere nʼaka ndị ga-elekọta ya anya ma pụọ gaa njem nʼala ọzọ ebe ọ nọrọ ogologo oge.
LUK 20:10 Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zigara otu nʼime ndị ohu ya ka ọ bịakwute ndị ahụ na-elekọtara ya ubi, ka ha nyekwa ya ụfọdụ nʼime mkpụrụ ubi vaịnị ahụ. Ma ndị na-elekọtara ya ubi jidere ya, tie ya ihe, zilaga ya nʼaka efu.
LUK 20:11 O zigakwara ohu ya ọzọ. Ma ha tikwara ya ihe mee ya ihe ihere, zilakwaa ya nʼaka efu.
LUK 20:12 O zigakwara onye nke atọ, ma ha merụrụ ya ahụ, chụlaa ya.
LUK 20:13 “Mgbe ahụ, onyenwe ubi vaịnị ahụ sịrị, ‘Gịnị ka m ga-eme? Aga m ezigara ha ọkpara m, nke m hụrụ nʼanya, ma eleghị anya ha ga-asọpụrụ ya.’
LUK 20:14 “Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ya, ha kwurịtara nʼetiti onwe ha, sị, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a, ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’
LUK 20:15 Ya mere, ha kpụfere ya nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya. “Gịnị ka onye nwe ubi ahụ ga-eme ha?
LUK 20:16 Ọ ga-abịa, laa ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ nʼiyi, were ubi vaịnị ahụ nye ndị ọzọ.” Mgbe ndị ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Chineke ekwela.”
LUK 20:17 O legidere ha anya sị, “Gịnịkwa ka unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ pụtara, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ aghọọla nkume nke isi ntọala ụlọ’?
LUK 20:18 Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume ahụ, ka a ga-etiwasị, ma onye ọbụla ọ dakwasịrị, ka ọ ga-egwepịa.”
LUK 20:19 Ndị ozizi iwu na ndịisi nchụaja chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼotu oge ahụ nʼihi na ha matara na ọ bụ ha ka o bu nʼobi tụọ ilu ahụ, ma ha tụrụ egwu ndị mmadụ.
LUK 20:20 Ya mere, ha chere ya nche nke ọma, ma zipụ ndị nnyopụta, ndị mere onwe ha dịka ndị ezi omume, ka ha chọpụta ma o nwere ụzọ ha ga-esi jide ya site nʼihe ọ ga-ekwu, ka ha site na nke a nyefee ya nʼaka ọchịchị na ike onyeisi ala.
LUK 20:21 Ya mere ndị nnyopụta ahụ jụrụ ya sị, “Onye ozizi, anyị mara na i na-ekwu ma na-ezikwa ihe ziri ezi, matakwa na i dịghị ele mmadụ anya nʼihu, kama ị na-ezi ụzọ Chineke dị ka eziokwu si dị.
LUK 20:22 O ziri ezi nʼiwu ka anyị tụọ ụtụ isi nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?”
LUK 20:23 Ma ọ matara na nke a bụ ajụjụ aghụghọ, ya mere ọ sịrị ha,
LUK 20:24 “Gosinụ m otu mkpụrụ ego denarị. Isi onye ka e sere nʼelu ya, aha onye ka e dekwasịkwara ya?” Ha sịrị, “Ọ bụ nke Siza.”
LUK 20:25 Ọ sịrị ha, “Ya mere, nyenụ Siza ihe bụ nke Siza, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke Chineke.”
LUK 20:26 Ha enweghị ike ijide ya nʼihi ihe o kwuru nʼebe ahụ, nʼihu ọha mmadụ. Ọsịsa ya juru ha anya, ha mechikwara ọnụ.
LUK 20:27 Ụfọdụ ndị Sadusii, ndị sị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya
LUK 20:28 ma jụọ ya sị, “Onye ozizi, Mosis deere anyị na ọ bụrụ na nwanne nwoke mmadụ anwụọ hapụ nwunye ya na-amụtaghị nwa, na nwoke dị otu a ga-alụrụ nwunye nwanne ya nwoke ahụ, sị otu a, mụtara nwanne ya ụmụ.
LUK 20:29 Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, onye nke mbụ lụrụ nwanyị, nwụọ na-amụtaghị nwa.
LUK 20:30 Nke abụọ kwa
LUK 20:31 na onye nke atọ lụrụkwara ya. Nʼotu aka ahụ ha asaa lụchara ya ma nwụọ na-amụtaghị nwa.
LUK 20:32 Nʼikpeazụ nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara.
LUK 20:33 Ya mere, nʼoge mbilite nʼọnwụ nwunye onye ka ọ ga-abụ? Nʼihi na ha asaa lụchara ya?”
LUK 20:34 Jisọs gwara ha, “Ndị nke ọgbọ a na-alụ nwunye, ma na-enyekwa ụmụ ha ka a lụrụ ha.
LUK 20:35 Ma ndị ahụ a gụrụ dị ka ndị kwesiri isoro keta oke nʼọgbọ ahụ, nakwa na mbilite nʼọnwụ agaghị alụ di na nwunye.
LUK 20:36 Nʼezie, ha apụghịkwa ịnwụ ọzọ, nʼihi na ha dị ka ndị mmụọ ozi. Ha bụ ụmụ Chineke, nʼihi na ha bụ ụmụ nke mbilite nʼọnwụ.
LUK 20:37 Ọ bụladị Mosis nʼonwe ya zipụtara na mbilite nʼọnwụ dị, nʼakụkọ banyere ọhịa ahụ na-ere ọkụ, mgbe ọ na-akpọ Onyenwe anyị ‘Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.’
LUK 20:38 Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ, nʼihi nʼebe ọ nọ mmadụ niile dị ndụ.”
LUK 20:39 Ụfọdụ ndị ozizi iwu zara ya sị, “Onye ozizi, ị kwuru nke ọma.”
LUK 20:40 O nwekwaghị onye ọbụla jụrụ ya ajụjụ ọzọ.
LUK 20:41 Ma ọ sịrị ha, “Olee otu ha si kwuo na Kraịst ahụ bụ nwa Devid?
LUK 20:42 Devid nʼonwe ya kwupụtara nʼakwụkwọ Abụ Ọma, sị: “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m, “Nọdụ ala nʼaka nri m
LUK 20:43 ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” ’
LUK 20:44 Devid nʼonwe ya kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị.’ Oleekwanụ otu o si bụrụ nwa ya?”
LUK 20:45 Mgbe ndị mmadụ na-ege ntị, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya,
LUK 20:46 “Kpacharanụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, ndị hụrụ ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa nʼanya. Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla.
LUK 20:47 Ha na-eripịa ihe niile dị nʼụlọ ndị inyom ndị di ha nwụrụ anwụ, nʼekpe ogologo ekpere ka a hụta ha. Ndị dị otu a ka a ga-ata ahụhụ dị ukwuu.”
LUK 21:1 Ọ leliri anya elu hụ ka ndị ọgaranya si etinye onyinye ha nʼime igbe onyinye.
LUK 21:2 Ọ hụkwara otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ ka ọ bịara tinye naanị mkpụrụ ego kọpa abụọ.
LUK 21:3 Ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, nwanyị ogbenye a di ya nwụrụ etinyela ego karịa ndị ọzọ niile.
LUK 21:4 Nʼihi na ndị ọzọ niile nyere onyinye ha site nʼego mapụtaara ha nʼakụnụba ha, ma ya onwe ya sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o ji biri.”
LUK 21:5 Mgbe ụfọdụ na-ekwu okwu banyere otu e si were nkume mara mma na onyinye e chere nʼihu Chineke, chọọ ụlọnsọ ukwu ahụ mma, ọ sịrị,
LUK 21:6 “Ma banyere ihe ndị a, oge na-abịa mgbe ihe ndị a niile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. Ọ dịghị otu nkume a ga-ahapụ nʼelu ibe ya, a ga-akwatusị ha niile.”
LUK 21:7 Ha jụrụ ya sị, “Onye ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-egosi na ha na-aga imezu?”
LUK 21:8 Ọ sịrị, “Lezienụ anya ka a ghara iduhie unu nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya,’ na-asịkwa na ‘Oge ahụ dị nso.’ Unu esokwala ha.
LUK 21:9 Mgbe ọbụla unu nụrụ akụkọ agha dị iche iche na ọgbaaghara, ka ụjọ ghara ịtụ unu, ihe ndị a aghaghị ibu ụzọ mezuo, ma ọgwụgwụ oge erubeghị.”
LUK 21:10 Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze.
LUK 21:11 A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nʼebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe dị egwu na ihe ịrịbama dị ukwuu site na mbara eluigwe.
LUK 21:12 “Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide unu, kpagbukwaa unu. Ha ga-enyefe unu nʼaka ọtụtụ ụlọ ekpere. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-akpọpụkwa unu nʼihu ndị eze na ndị ọchịchị nʼihi aha m.
LUK 21:13 Nke a ga-abụrụ unu ohere iji gbaa akaebe.
LUK 21:14 Ma burunu ụzọ kpebie nʼobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu maka ihe unu ga-aza.
LUK 21:15 Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide.
LUK 21:16 Ọ bụladị ndị mụrụ unu, ụmụnne unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị ikwu unu na ndị enyi unu, ha ga-arara unu nye nʼaka ndị ọchịchị, ndị ga-egbukwa ụfọdụ nʼime unu.
LUK 21:17 Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m.
LUK 21:18 Ma otu agịrị isi dị nʼisi unu agaghị ala nʼiyi.
LUK 21:19 Unu ga-azọpụta ndụ unu site na ntachiobi unu.
LUK 21:20 “Mgbe unu hụrụ ka ndị agha gbara Jerusalem gburugburu, matanụ na oge e ji ala ya nʼiyi eruola.
LUK 21:21 Nʼoge ahụ ka ndị nọ na Judịa gbalaga nʼugwu, ka ndị nọ nʼime obodo si na ya pụta, ka ndị na-anọghị nʼobodo gharakwa ịba nʼime ya.
LUK 21:22 Nʼihi na oge a ga-abụ oge ịbọ ọbọ ka e mezuo ihe niile akwụkwọ nsọ kwuru.
LUK 21:23 Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ! A ga-enwe oke ihe mgbu nʼala a, iwe ga-adakwasịkwa ụmụ mmadụ.
LUK 21:24 Mma agha ga-egbu ha, mba niile ga-adọrọkwa ha nʼagha. Ndị mba ọzọ ga na-azọtọsị Jerusalem nʼụkwụ ruo mgbe oge nke ndị mba ọzọ ahụ zuru.
LUK 21:25 “A ga-enwe ihe ịrịbama nʼanyanwụ, nʼọnwa, na kpakpando. Nʼelu ụwa, mba niile ga-anọ nʼoke ahụhụ na mgbagwoju anya dị ka oke osimiri na-eme mkpọtụ, ebili mmiri ga na-ebilikwa.
LUK 21:26 Ndị mmadụ ga-adakwa mba nʼobi nʼihi ụjọ mgbe ha ghọtara ihe gaje ịbịakwasị ụwa, nʼihi na a ga-eme ka ike niile nke dị nʼeluigwe maa jijiji.
LUK 21:27 Nʼoge ahụ, a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼike na ebube nʼigwe ojii.
LUK 21:28 Mgbe ihe ndị a malitere ime, guzoronụ ọtọ welie isi unu elu, nʼihi na oge mgbapụta unu dị nso.”
LUK 21:29 Ọ tụụrụ ha ilu a, “Leenụ osisi fiig na osisi ndị ọzọ niile anya.
LUK 21:30 Mgbe ha bidoro ipupụta ahịhịa ọhụrụ, unu na-amata na ọkọchị adịla nso.
LUK 21:31 Nʼụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke adịla nso.
LUK 21:32 “Nʼezie agwa m unu, ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo.
LUK 21:33 Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.
LUK 21:34 “Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya.
LUK 21:35 Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa.
LUK 21:36 Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ.”
LUK 21:37 Kwa ụbọchị, ọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma nʼuhuruchi, ọ na-arịgoro nʼelu Ugwu Oliv ị ga nọọ ọnọdụ abalị.
LUK 21:38 Ndị mmadụ niile na-abịakwute ya nʼisi ụtụtụ niile nʼụlọnsọ ukwu ịnụrụ okwu ya.
LUK 22:1 Nʼoge a, Mmemme Achịcha na-ekoghị eko nke a na-akpọ Ngabiga na-eru nso.
LUK 22:2 Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya, nʼihi na ha na-atụ egwu ndị mmadụ.
LUK 22:3 Mgbe ahụ, ekwensu banyere nʼime Judas, onye a na-akpọ Iskarịọt, otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya.
LUK 22:4 Ọ gakwuru ndịisi nchụaja, na ndịisi ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ya na ha akparịta ụka otu ọ ga-esi rara ya nyefee ya nʼaka ha.
LUK 22:5 Ha ṅụrịrị ọṅụ ma kwekwa nkwa inye ya ego.
LUK 22:6 O kwenyere, na-achọkwa ohere ga-adị mma ọ ga-eji nyefee ya nʼaka ha mgbe igwe mmadụ na-agaghị anọ.
LUK 22:7 O ruo nʼụbọchị Mmemme Achịcha na-ekoghị eko ahụ bụ ụbọchị a na-eji atụrụ Ngabiga achụ aja.
LUK 22:8 O zipụrụ Pita na Jọn sị, “Gaanụ kwadoo maka oriri Ngabiga nke anyị ga-eri.”
LUK 22:9 Ha sịrị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoo maka ya?”
LUK 22:10 Ọ sịrị ha, “Lee, ka unu na-abata nʼobodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu, soronụ ya baa nʼụlọ ọbụla ọ banyere.
LUK 22:11 Sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, ‘Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ndị ọbịa ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri Ngabiga?’
LUK 22:12 Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu dị nʼelu ụlọ nke e dozicharala ihe niile, kwadoonụ nri anyị nʼebe ahụ.”
LUK 22:13 Ha gara chọpụta ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ha kwadokwara nri Ngabiga ahụ.
LUK 22:14 Mgbe oge awa ahụ ruru, ya na ndị na-eso ụzọ ya gara ebe ahụ nọdụ ala iri ihe.
LUK 22:15 Ọ sịrị ha, “Ọ gụrụ m nnọọ agụụ ka mụ na unu rie nri Ngabiga a tupu mụ ataa ahụhụ.
LUK 22:16 Nʼihi na asị m unu, agaghị m erikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe a ga-emezu ya nʼalaeze Chineke.”
LUK 22:17 O buru iko, mgbe o nyechara ekele ọ sịrị, “Burunu nke a kesaa nʼetiti unu.
LUK 22:18 Nʼihi na asị m unu, site ugbu a ga nʼihu, agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, ruo mgbe alaeze Chineke ga-abịa.”
LUK 22:19 O werekwara otu ogbe achịcha, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawaa ya nye ha sị, “Nke a bụ ahụ m nke e nyere nʼihi unu. Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”
LUK 22:20 Nʼotu ụzọ ahụ, mgbe ha risiri nri anyasị o buuru iko sị, “Iko a bụ iko nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m, nke a na-awụpụ nʼihi unu.
LUK 22:21 Ma lee, onye ahụ nke ga-arara m nye nọnyeere m, o sokwa m na-eri nri.
LUK 22:22 Nwa nke Mmadụ na-aga ịnwụ dị ka e kpebiri ya, ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ a ga-esi nʼaka ya rara ya nye.”
LUK 22:23 Ha bidoro ịjụrịta onwe ha onye ọ bụ nʼetiti ha ga-eme nke a.
LUK 22:24 Ịrụ ụka malitere nʼetiti ha banyere onye nʼime ha ka a na-agụ na ọ dị ukwuu karịa ibe ya.
LUK 22:25 Ma ọ sịrị ha, “Ndị eze ndị mba ọzọ na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. Otu aka ahụkwa, a na-akpọ ndị na-achị achị enyi ndị mmadụ.
LUK 22:26 Ma unu onwe unu agaghị adị otu a. Kama onye kachasị ibe ya ịdị elu dịrị ka onye dịkarịsịrị nta. Ka onyeisi dịrị ka onye na-eje ozi.
LUK 22:27 Onye dị elu karịa ibe ya? Ọ bụ onye nọdụrụ ala rie nri na tebul ka ọ bụ onye siri nri dozie ya na tebul? Ọ bụghị onye nọdụrụ ala rie nri na tebul? Ma adị m ka onye na-eje ozi nʼetiti unu.
LUK 22:28 Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile.
LUK 22:29 Ana m enye unu alaeze dị ka Nna m nyere m ya.
LUK 22:30 Ka unu nwe ike isoro m rie ma ṅụọkwa nʼalaeze m. Sorokwa m nọdụ nʼocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.
LUK 22:31 “Saimọn, Saimọn, lee ekwensu arịọla ike ịyọcha unu dị ka ọka wiiti.
LUK 22:32 Ma ekpeelara m gị ekpere ka okwukwe gị ghara ịda. Mgbe ị kwudosiri ike, gbaakwa ụmụnna gị ume.”
LUK 22:33 Ma ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ejikeere m isoro gị gaa mkpọrọ, ma sorokwa gị nwụọ.”
LUK 22:34 Jisọs zara, “Agwa m gị Pita, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ, si na ị maghị onye m bụ.”
LUK 22:35 Ọ gwara ha, “Mgbe m zipụrụ unu na mbụ sị unu ewerekwala ego, maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ, o nwere ihe kọrọ unu?” Ha sịrị, “O nweghị ihe kọrọ anyị.”
LUK 22:36 Ọ sịrị ha, “Ugbu a, ọ bụrụ na i nwere akpa ego, were ya, ma werekwa akpa ije. Ọ bụrụkwa na i nweghị mma agha ree uwe mgbokwasị gị zụtara onwe gị otu.
LUK 22:37 Nʼihi na agwa m unu, na a ga-emejupụta ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ nʼime m, A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.Nʼezie, ihe e dere banyere m eruwela mgbe ọ ga-emezu.”
LUK 22:38 Ha sịrị, “Onyenwe anyị, lee mma agha abụọ dị ebe a.” Ọ sịrị ha, “Nke ahụ ezuola.”
LUK 22:39 Jisọs pụrụ gaa nʼUgwu Oliv dị ka ọ na-eme mgbe dum, ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya gaa.
LUK 22:40 Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ sịrị ha, “Kpeenụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.”
LUK 22:41 Ọ hapụrụ ha gaa ihe ha ka nzọ ụkwụ ole na ole nọrọ nʼebe ahụ gbuo ikpere nʼala kpee ekpere, sị,
LUK 22:42 “Nna ọ bụrụ na ị chọrọ, nara m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mezuo uche gị.”
LUK 22:43 Otu mmụọ ozi si nʼeluigwe bịakwutere ya, gbaakwa ya ume.
LUK 22:44 Site nʼoke ihe mgbu, o kpere ekpere kpesie ike, nke mere na ọsụsọ si ya nʼahụ na-adapụ nʼala dị ka ọkpụrụkpụ ọbara.
LUK 22:45 Mgbe o kpechara ekpere bilie, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya hụ ha ka ha na-arahụ ụra nʼihi ihe mwute nke obi.
LUK 22:46 Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-arahụ ụra? Bilienụ kpee ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.”
LUK 22:47 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe mmadụ bịara, onye du ha bụ onye a na-akpọ Judas, bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya. Ọ bịaruru Jisọs nso, isutu ya ọnụ.
LUK 22:48 Ma Jisọs sịrị ya, “Judas, ọ bụ site nʼisutu ọnụ ka i ji arara Nwa nke Mmadụ nye?”
LUK 22:49 Mgbe ndị nọ ya gburugburu hụrụ ihe gaje ime, ha sịrị, “Onyenwe anyị, ọ bụ anyị were mma agha gbuo?”
LUK 22:50 Otu nʼime ha ji mma gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya.
LUK 22:51 Ma Jisọs sịrị, “O zuola!” O metụkwara ntị nwoke ahụ aka gwọọ ya.
LUK 22:52 Mgbe ahụ, Jisọs sịrị ndịisi nchụaja, na ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu na ndị okenye, “Gịnị mere unu ji chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m, dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi o ji egbe ezu?
LUK 22:53 Mgbe mụ na unu na-anọ kwa ụbọchị nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, ma unu emetụghị m aka. Ma ugbu a bụ oge awa unu bụrụkwa mgbe ike ọchịchịrị na-achị achị.”
LUK 22:54 Mgbe ahụ ha jidere ya duru ya pụọ, gaa nʼụlọ onyeisi nchụaja. Pita sokwara ha nʼazụ kama ọ nọ nʼebe dị anya.
LUK 22:55 Mgbe ha kwanyere ọkụ nʼetiti mbara ezi obi ahụ, ma nọdụ ala gba ọkụ ahụ gburugburu, Pita sokwara ha nọdụ ala.
LUK 22:56 Ka ọ na-anya ọkụ ahụ, otu nwaagbọghọ na-eje ozi hụrụ ya, o leruru ya anya nke ọma, sị, “Onye a na Jisọs nọkọrọ.”
LUK 22:57 Ma ọ gọrọ agọ sị, “Nwanyị, amaghị m onye ọ bụ.”
LUK 22:58 Mgbe oge nta gasịrị, onye ọzọ hụkwara ya kwukwaa sị, “Gị onwe gị bụkwa otu onye nʼime ha.” Ma Pita kwuru sị, “Nwoke m, abụghị m.”
LUK 22:59 Mgbe ihe dị ka otu awa gafere, onye ọzọ bịakwara kwusie okwu ike, “Nʼezie, nwoke a so ya nʼihi na ọ bụ onye Galili.”
LUK 22:60 Pita sịrị, “Nwoke m, amaghị m ihe ị na-ekwu maka ya?” Dị ka ọ kpụ okwu ahụ nʼọnụ, oke ọkpa kwara akwa.
LUK 22:61 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tụgharịrị lee Pita anya. Pita chetakwara okwu Onyenwe anyị gwara ya nke bụ, “Tupu oke ọkpa akwa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
LUK 22:62 Ma ọ pụrụ nʼezi gaa bee akwa na mwute.
LUK 22:63 Ndị ahụ na-eche ya nche bidoro na-akwa ya emo na-etikwa ya ihe.
LUK 22:64 Ha jiri akwa kechie ya anya, sị ya, “Buo amụma, onye tiri gị ihe?”
LUK 22:65 Ha kwukwara ọtụtụ okwu ọjọọ na nke mkparị megide ya.
LUK 22:66 Mgbe chi bọrọ, nzukọ ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu zukọtara, a kpọtakwara Jisọs nʼihu ha.
LUK 22:67 Ha na-ekwu, “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na m agwa unu, unu agaghị ekwe.
LUK 22:68 Ọ bụrụkwa na m ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza m.
LUK 22:69 Ma site ugbu a gawa, Nwa nke Mmadụ ga-anọdụ ala nʼaka nri nke ike Chineke.”
LUK 22:70 Ha niile sịrị, “Gị onwe gị, ị bụ Ọkpara Chineke?” Ọ sịrị ha, “Unu kwuru na Abụ m.”
LUK 22:71 Mgbe ahụ ha sịrị, “Gịnị mere anyị ji na-achọ onye akaebe ọzọ? Anyị ejirila ntị anyị nụrụ ya site nʼọnụ ya.”
LUK 23:1 Mgbe ahụ, ọha mmadụ ahụ niile biliri duru ya gakwuru Pailet.
LUK 23:2 Ha malitere ibo ya ebubo na-asị, “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eduhie ndị obodo anyị niile, na-egbochikwa ha ịtụ ụtụ isi nye Siza, ma na-ekwukwa na ya bụ Kraịst, Eze.”
LUK 23:3 Ya mere Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara ya sị, “Gị onwe gị kwuru otu a.”
LUK 23:4 Mgbe ahụ Pailet gwara ndịisi nchụaja na igwe mmadụ ahụ, “O nweghị ihe ọjọọ ọbụla m chọpụtara nwoke a mere.”
LUK 23:5 Ma ha gara nʼihu na-asị, “Ọ na-akpasu ọgbaaghara nʼala ndị Judịa niile site nʼozizi ya. Ọ malitere na Galili, ọ bịakwala ebe a ugbu a.”
LUK 23:6 Mgbe Pailet nụrụ nke a, ọ jụrụ ma nwoke a ọ bụ onye Galili?
LUK 23:7 Mgbe ọ matara na o si nʼebe Herọd na-achị, o nyere iwu ka e dugara ya Herọd, onye nọkwa na Jerusalem mgbe ahụ.
LUK 23:8 Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu, mgbe ọ hụrụ Jisọs nʼihi na ọ nọ na-achọ ịhụ ya anya nʼoge dị anya gara aga. Sitekwa nʼakụkọ ọ nụrụ banyere ya, o lere anya na ọ ga-arụ ọrụ ebube ụfọdụ.
LUK 23:9 Ya mere ọ jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ, ma ọ zaghị ya ihe ọbụla.
LUK 23:10 Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu guzo nʼebe ahụ gara nʼihu bosie ya ebubo ike.
LUK 23:11 Emesịa, Herọd na ndị agha ya jiri ya mee ihe ọchị, ma kwaakwa ya emo. Ha yikwasịrị ya uwe mwụda mara mma ma zighachikwara ya Pailet.
LUK 23:12 Nʼụbọchị ahụ ka Herọd na Pailet ghọrọ enyi, maka nʼoge gara aga ha bụ ndị iro.
LUK 23:13 Pailet kpọkọtara ndịisi nchụaja, na ndị ndu, na ndị mmadụ ndị ọzọ
LUK 23:14 sị ha, “Unu kpọtaara m nwoke a dị ka otu onye nʼime ndị na-akpali ndị mmadụ inupu isi. Ajụọla m ya ajụjụ nʼihu unu ma achọpụtaghị m ihe ọbụla nke unu kwesiri iji boo ya ebubo.
LUK 23:15 Ọ bụladị Herọd achọpụtaghị ihe ọjọọ ọbụla nʼaka ya, nke a mere o jiri kpụghachitere anyị ya. Leenụ, o nweghị ihe ọbụla o mere e kwesiri iji maa ya ikpe ọnwụ.
LUK 23:16 Ya mere aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.”
LUK 23:17 Ma ọ dị mkpa na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ nʼoge mmemme.
LUK 23:18 Ma igwe mmadụ ahụ tiri mkpu nʼotu olu sị, “Gbuo nwoke a, hapụrụ anyị Barabas.”
LUK 23:19 (Onye a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara dapụtara nʼobodo ahụ, nakwa nʼihi igbu mmadụ.)
LUK 23:20 Dị ka ọ gbalịsịrị ike ịhapụ Jisọs, Pailet gwakwara ha okwu ọzọ.
LUK 23:21 Ma ha niile tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!”
LUK 23:22 Ọ sịrị ha na nke ugboro atọ, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ nwoke a mere? O nweghị ihe ọbụla m chọpụtara nʼaka ya kwesiri iwetara ya ọnwụ. Ya mere aga m ata ya ahụhụ, hapụ ya.”
LUK 23:23 Ma ha nọgidere na-eti mkpu nʼoke olu ka a kpọgide ya nʼobe, nʼikpeazụ olu iti mkpu ha karịrị.
LUK 23:24 Ya mere Pailet kpebiri imere ha ihe ha chọrọ.
LUK 23:25 Ọ hapụrụ nwoke ahụ ha chọrọ nke a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara na igbu mmadụ, ma nyefee ha Jisọs nʼaka.
LUK 23:26 Dị ka ha duu ya na-aga, ha jidere Saimọn onye Sirini bụ onye si nʼime otu obodo nta na-alọbata; ha boro ya obe ahụ, manye ya ka o buru ya na-eso Jisọs na-azụ.
LUK 23:27 Igwe mmadụ dị ukwuu soro ya tinyekwara ụmụ nwanyị bụ ndị tiri mkpu akwa ma ruokwara ya ụjụ.
LUK 23:28 Ma Jisọs tụgharịrị sị ha, “Ụmụada Jerusalem, unu eberela m akwa, kama beerenụ onwe unu na ụmụ unu.
LUK 23:29 Nʼihi na oge na-abịa mgbe unu ga-asị, ‘Ngọzị na-adịrị ụmụ nwanyị aga, akpanwa ndị na-amụghị nwa, na ara ndị na-enweghị onye ṅụrụ ha.’
LUK 23:30 Mgbe ahụ, “ ‘ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Dakwasị anyị!” Sịkwa, ugwu nta, “Kpuchite anyị!” ’
LUK 23:31 Ya mere, ọ bụrụ na ha mee ọhịa otu a mgbe ahịhịa dị ndụ dị na ya, gịnị ga-emekwanụ mgbe ọ kpọrọ nkụ?”
LUK 23:32 Ha dukwaara mmadụ abụọ bụ ndị ohi gaa igbu ha na ya.
LUK 23:33 Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi, ebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe ya na ndị ohi abụọ ahụ. Otu nʼaka nri ya nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
LUK 23:34 Jisọs sịrị, “Nna gbaghara ha nʼihi na ha amataghị ihe ha na-eme.” Ha ji ife nza kee uwe ya nʼetiti onwe ha.
LUK 23:35 Ndị mmadụ guzoro ebe ahụ na-ele anya, ka ndị ọchịchị ji ya na-eme ihe ọchị, na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ya zọpụtanụ onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ bụ Kraịst nke Chineke, bụ Onye a họpụtara.”
LUK 23:36 Ndị agha bịakwara chịa ya ọchị. Ha nyere ya mmanya gbara ụka,
LUK 23:37 ma na-asị, “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụtanụ onwe gị.”
LUK 23:38 Ihe e dere nʼelu isi obe ahụ bụ: Onye a bụ Eze ndị Juu.
LUK 23:39 Otu onye nʼime ndị ohi ahụ a kpọgidekwara nʼobe nʼebe ahụ kparịkwara ya sị, “Ọ bụghị gị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị ma zọpụtakwa anyị.”
LUK 23:40 Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, “Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya.
LUK 23:41 Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla.”
LUK 23:42 Mgbe ahụ ọ sịrị, “Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị.”
LUK 23:43 Ọ sịrị ya, “Nʼezie a agwa m gị, taa, ị ga-anọnyere m na paradaịs.”
LUK 23:44 Mgbe ọ na-eru ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile ruo elekere atọ nke ehihie.
LUK 23:45 Nʼihi na anyanwụ kwụsịrị inye ihe ya. Akwa mgbochi dị nʼụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ.
LUK 23:46 Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Nna, nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” Mgbe o kwusiri nke a, o kubiri ume.
LUK 23:47 Mgbe ọchịagha na-achị otu narị ndị agha hụrụ ihe merenụ, o nyere Chineke otuto ma kwuokwa sị, “Nʼezie nwoke a bụ onye ezi omume.”
LUK 23:48 Mgbe igwe mmadụ niile gbakọtara ilere anya hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼụlọ ha na-eti aka nʼobi.
LUK 23:49 Ma ndị niile maara onye ọ bụ, tinyekwara ụmụ nwanyị ndị soro ya si Galili bịa, guzokwara nʼebe dị anya na-ele ihe ndị a.
LUK 23:50 O nwere otu nwoke aha ya bụ Josef, onye so nʼotu ndịisi ụlọ nzukọ. Ọ bụ ezigbo mmadụ na onye aka ya kwụ ọtọ.
LUK 23:51 Ọ kwadoghị mkpebi ha na omume ha. Onye sitere Arimatia, nʼotu obodo ndị Juu, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke.
LUK 23:52 Nwoke a gakwuru Pailet rịọọ ka e bunye ya ahụ Jisọs.
LUK 23:53 Ya mere, o budatara ya fụchie ya nʼakwa ọcha linin, tinye ya nʼili e gwuru nʼọgba nkume, nke a na-etinyebeghị mmadụ na mbụ.
LUK 23:54 Ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe maka ụbọchị izuike nke na-abịa nso.
LUK 23:55 Ndị nwanyị ahụ sitere Galili soro ya hụrụ ili ahụ, hụkwa otu e si nibe ahụ ya nʼime ya.
LUK 23:56 Emesịa ha laghachiri ga kwadoo mmanụ otite nke e tinyere ọtụtụ ụda. Nʼụbọchị izuike ha zukwara ike dịka ọ dị nʼiwu.
LUK 24:1 Nʼụbọchị mbụ nke izu ụka, nʼezigbo isi ụtụtụ, ha weere mmanụ otite ahụ ha tinyere ọtụtụ ụda nke ha kwadoro gawa nʼili ahụ.
LUK 24:2 Ha chọpụtara na e nupụla nkume e ji dochie nʼọnụ ili ahụ.
LUK 24:3 Ma mgbe ha banyere nʼime ya, ha ahụghị ahụ Onyenwe anyị Jisọs.
LUK 24:4 Dị ka ha nọ na mgbagwoju anya banyere nke a, nʼotu ntabi anya, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe na-egbu ka amụma guzo ha nso.
LUK 24:5 Ha kpudoro ihu ha nʼala nʼihi oke egwu, ma mmadụ abụọ ahụ gwara ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ?
LUK 24:6 Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị,
LUK 24:7 ‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’ ”
LUK 24:8 Mgbe ahụ ha chetara okwu ya.
LUK 24:9 Mgbe ha sitere nʼili ahụ lọghachi, ha kọọrọ mmadụ iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a.
LUK 24:10 Ọ bụ Meri Magdalin, na Joana, na Meri nne Jemis na ụmụ nwanyị ndị ọzọ so ha kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe a.
LUK 24:11 Ma ha ekweghị ihe ha gwara ha, nʼihi na okwu ha dị ha ka ọ bụ ihe efu.
LUK 24:12 Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara.
LUK 24:13 Nʼotu ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ nʼime ha gaje nʼobodo nta a na-akpọ Emaus, nke dị ihe ruru kilomita iri na abụọ site na Jerusalem.
LUK 24:14 Ha na-ekwurịta nʼetiti onwe ha banyere ihe niile mere.
LUK 24:15 Dị ka ha na-ekwu na-akparịta ụka banyere ihe ndị a, Jisọs nʼonwe ya bịara soro ha na-aga ije.
LUK 24:16 Ma e mechiri anya ha ịmata na ọ bụ ya.
LUK 24:17 Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-ekwurịta nʼetiti onwe unu dị ka unu na-aga nʼụzọ.” Ha kwụsịrị ebe ahụ, gbarụọ ihu ha.
LUK 24:18 Otu onye nʼime ha a na-akpọ Kleopas, sịrị ya, “Ị bụ onye ọbịa na Jerusalem nke mere na ị maghị ihe mere nʼime ya nʼụbọchị ndị a?”
LUK 24:19 Ọ sịrị ha, “Gịnị bụ ihe mere?” Ha sịrị ya, “Banyere Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma bụrụkwa onye dị ike, ma nʼokwu ma nʼomume nʼihu Chineke na mmadụ niile.
LUK 24:20 Na otu ndịisi nchụaja na ndị ọchịchị anyị nyefere ya ka a maa ya ikpe ọnwụ, ma kpọgbukwaa ya nʼobe.
LUK 24:21 Anyị nwererịị olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta Izrel. Nke ka nke, taa mere ya abalị atọ kemgbe ihe ndị a mere.
LUK 24:22 Tụkwasị ihe ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị anyị mere ka anyị nwee ihe ịtụnanya. Ha gara nʼili ahụ nʼisi ụtụtụ a.
LUK 24:23 Ma ha ahụghị ahụ ya. Ha bịara kọrọ anyị na ha hụrụ ọhụ nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị gwara ha na ọ dị ndụ.
LUK 24:24 Ya mere ụfọdụ nʼime ndị otu anyị gara nʼili ahụ chọpụta na ihe niile ụmụ nwanyị a kwuru mere otu ahụ ha siri kwuo ya. Ma ha ahụkwaghị ya.”
LUK 24:25 Ọ sịrị ha, “Unu bụ nnọọ ndị nzuzu!Leenụ ka o si siere unu ike ikwere ihe niile ndị amụma kwuru.
LUK 24:26 Ọ bụ na o kwesighị ka Kraịst taa ahụhụ ndị a tupu ọ banye nʼebube ya?”
LUK 24:27 Ya mere, ọ kọwaara ha ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ banyere ya onwe ya malite na nke Mosis ruo na ndị amụma niile.
LUK 24:28 Mgbe ha na-eru obodo nta ahụ ha na-aga, o mere dị ka ọ na-aga nʼihu na njem ya.
LUK 24:29 Ma ha rịọ ya nʼebe ọ dị ukwuu sị, “Nọnyerenụ anyị nʼihi na chi ebidola iji, ụbọchị agamiekwala ugbu a.” Nʼihi ya ọ banyere ịga nọnyere ha.
LUK 24:30 Mgbe ya na ha nọdụrụ na tebul iri nri, o were achịcha, kelee Chineke ekele, nyawaa ya were ya nye ha.
LUK 24:31 Mgbe ahụ, e meghere anya ha, ha amata onye ọ bụ, ha ahụkwaghị ya anya ọzọ.
LUK 24:32 Mgbe ahụ, ha gwara onwe ha sị, “Ọ bụ na ọ dịghị ka ọkụ ọ na-enwu nʼobi anyị mgbe anyị na ya nọ nʼụzọ, ya na-ekpughere anyị akwụkwọ nsọ?”
LUK 24:33 Ha biliri ngwangwa laghachi Jerusalem. Ebe ahụ, ha hụrụ mmadụ iri na otu ahụ na ndị so ha ka ha nọkọtara nʼotu ebe,
LUK 24:34 na-asị, “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị ebiliela, o gosila Saimọn onwe ya.”
LUK 24:35 Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha.
LUK 24:36 Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.”
LUK 24:37 Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ.
LUK 24:38 Ma ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ?
LUK 24:39 Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.”
LUK 24:40 Mgbe o kwuchara nke a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya.
LUK 24:41 Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha, “Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?”
LUK 24:42 Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ.
LUK 24:43 Ma ọ naara ya rie ya nʼihu ha.
LUK 24:44 Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.”
LUK 24:45 Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ.
LUK 24:46 Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilienʼụbọchị nke atọ.
LUK 24:47 Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem.
LUK 24:48 Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a.
LUK 24:49 Ma lee, agaje m izitere unu ihe ahụ Nna m kwere na nkwa. Ya mere, nọrọnụ nʼime obodo ruo mgbe a ga-eyikwasị unu ike nke si nʼelu.”
LUK 24:50 O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha.
LUK 24:51 Dị ka ọ na-agọzi ha, ọ sitere nʼebe ha nọ pụọ, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe.
LUK 24:52 Mgbe ahụ, ha fere ya ofufe jiri oke ọṅụ laghachi na Jerusalem.
LUK 24:53 Ha nọgidere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-eto Chineke oge niile.
JOH 1:1 Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke.
JOH 1:2 Ya na Chineke nọ site na mbụ.
JOH 1:3 E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya.
JOH 1:4 Nʼime ya ka ndụ dịrịị, ndụ ahụ bụkwa ìhè nye mmadụ niile,
JOH 1:5 ìhè ahụ na-enwu nʼime ọchịchịrị, ma ọchịchịrị ahụ emenyụghị ya.
JOH 1:6 Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn.
JOH 1:7 Ọ bịara dị ka onye akaebe ịgba ama banyere ìhè ahụ, ka mmadụ niile site nʼaka ya kwere.
JOH 1:8 Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, ọ bịara naanị ịgba akaebe banyere ìhè ahụ.
JOH 1:9 Ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ ọbụla ìhè na-abịa nʼime ụwa.
JOH 1:10 Ọ bịara nʼụwa, ma ụwa bụ ihe e kere site nʼaka ya, ma ụwa amataghị onye ọ bụ.
JOH 1:11 Ọ bịakwutere ihe ndị ahụ bụ ndị nke ya, ma ndị ahụ bụ ndị nke ya anabataghị ya.
JOH 1:12 Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke.
JOH 1:13 Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke.
JOH 1:14 Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.
JOH 1:15 Jọn gbara ama banyere ya mgbe ọ na-eti mkpu na-asị, “Onye a bụ onye ahụ m kwuru banyere ya, ‘Onye na-abịa m nʼazụ dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’ ”
JOH 1:16 Site nʼịba ụba nke amara ya, anyị niile anatala amara a tụkwasịrị nʼamara.
JOH 1:17 Nʼihi na e nyere iwu site nʼaka Mosis, ma amara na eziokwu bịara site nʼaka Jisọs Kraịst.
JOH 1:18 Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya.
JOH 1:19 Nke a bụ ịgba ama Jọn mgbe ndị ndu ndị Juu nọ na Jerusalem zipụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị ka ha bịa jụọ ya onye ọ bụ?
JOH 1:20 O mechighị ọnụ ya, kama o kwupụtara sị, “Abụghị m Kraịst ahụ.”
JOH 1:21 Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Ị bụkwanụ onye? Ị bụ Ịlaịja?” Ọ zara sị ha, “Abụghị m ya.” “Ị bụ Onye amụma ahụ?” “Mba.”
JOH 1:22 Ha sịrị ya, “Ị bụ onye? Nye anyị ọsịsa anyị ga-eweghachiri ndị zitere anyị. Gịnị ka i kwuru banyere onwe gị?”
JOH 1:23 Ọ sịrị, dịka Aịzaya onye amụma kwuru, “Abụ m onye na-eti mkpu nʼime ọzara, ‘Meenụ ka ụzọ Onyenwe anyị guzozie.’ ”
JOH 1:24 Ma ndị Farisii ahụ ezitere
JOH 1:25 jụrụ ya, sị, “Gịnị mere i ji na-eme baptizim ọ bụrụ na ị bụghị Kraịst maọbụ Ịlaịja, maọbụ onye amụma ahụ?”
JOH 1:26 Jọn zara ha sị, “Eji m mmiri na-eme baptizim, ma ọ dị otu onye nọ nʼetiti unu nke unu na-amaghị.
JOH 1:27 Onye ahụ nke na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.”
JOH 1:28 Ihe a mere na Betani nʼofe osimiri Jọdan bụ ebe Jọn nọ na-eme baptizim.
JOH 1:29 Nʼechi ya, ọ hụrụ ka Jisọs na-abịakwute ya sị, “Leekwa, Nwa Atụrụ Chineke, onye na-ebupụ mmehie ụwa.
JOH 1:30 Ọ bụ onye a ka m kwuru okwu ya mgbe ahụ m sịrị, ‘otu nwoke na-abịa nʼazụ m, onye dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’
JOH 1:31 Mụ onwe m amataghị ya, ma a bịara m were mmiri na-eme baptizim nʼihi nke a, ka e kpughee ya nye ndị Izrel.”
JOH 1:32 Mgbe ahụ Jọn gbara ama a sị, “Ahụrụ m ka Mmụọ Nsọ sitere nʼeluigwe rịdata dị ka nduru, nọkwasị ya.
JOH 1:33 Mụ onwe m amabughị ya, ma onye ahụ zitere m ka m jiri mmiri mee baptizim kwuru, ‘Onye ahụ ị ga-ahụ, onye Mmụọ Nsọ ga-ebekwasị, ma nọgidekwa, ọ bụ ya ga-eji Mmụọ Nsọ mee baptizim.’
JOH 1:34 Mụ onwe m ahụla ya, na-agbakwa ama na onye a bụ Ọkpara Chineke.”
JOH 1:35 Nʼechi ya, Jọn na mmadụ abụọ ndị na-eso ụzọ ya guzoro nʼebe ahụ ọzọ.
JOH 1:36 Mgbe ọ hụrụ Jisọs ka ọ na-agafe, ọ sịrị, “Leenụ, Nwa Atụrụ Chineke.”
JOH 1:37 Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha tụgharịrị soro Jisọs.
JOH 1:38 Mgbe Jisọs tụgharịrị hụ ka ha na-eso ya, ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ?” Ha sịrị ya, “Rabbi” (nke pụtara “Onye ozizi”), “olee ebe i bi?”
JOH 1:39 Ọ sịrị ha, “Bịanụ, unu ga-ahụ.” Ha sooro ya ga hụ ebe ọ na-anọ. Ha nọnyekwara ya ụbọchị ahụ niile. Ọ bụ nʼihe dị ka elekere anọ nke mgbede.
JOH 1:40 Otu nʼime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru, nke sooro ya bụ Andru nwanne Saimọn Pita.
JOH 1:41 Ihe mbụ o mere bụ ịchọta Saimọn nwanne ya sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ” (onye a na-akpọkwa Kraịst).
JOH 1:42 Ọ kpọtaara ya Jisọs. O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita).
JOH 1:43 Nʼechi ya, o kpebiri ịga Galili. Mgbe ọ hụrụ Filip, ọ sịrị ya, “Soro m.”
JOH 1:44 Filip bụ onye obodo Betsaida dị ka Andru na Pita.
JOH 1:45 Filip chọtara Nataniel sị ya, “Anyị achọtala onye ahụ Mosis dere banyere ya nʼiwu, onye ndị amụma dekwara banyere ya, Jisọs onye Nazaret, nwa Josef.”
JOH 1:46 Nataniel sịrị ya, “Ihe ọma ọbụla ọ pụrụ i si na Nazaret pụta?” Ma Filip sịrị ya, “Bịa ka ị hụrụ.”
JOH 1:47 Mgbe Jisọs hụrụ ka Nataniel na-abịaru ya nso, o kwuru sị, “Leenụ ezi nwa afọ Izrel onye aghụghọ na-adịghị nʼime ya.”
JOH 1:48 Nataniel sịrị ya, “Olee otu i si mata onye m bụ?” Jisọs sịrị ya, “Tupu Filip akpọ gị, ahụlarị m gị ka ị nọ nʼokpuru osisi fiig.”
JOH 1:49 Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.”
JOH 1:50 Jisọs zara sị ya, “I kwere nʼihi na agwara m gị na ahụrụ m gị nʼokpuru osisi fiig? Ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a.”
JOH 1:51 Ọ sịkwara ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka o meghere hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arịgokwuru, ma na-arịdakwuru Nwa nke Mmadụ.”
JOH 2:1 Nʼụbọchị nke atọ, o nwere mmemme agbamakwụkwọ na Kena nke Galili, nne Jisọs bịakwara ebe ahụ.
JOH 2:2 A kpọkwara Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya oku na mmemme agbamakwụkwọ a.
JOH 2:3 Mgbe mmanya ha gwụrụ, nne Jisọs sịrị ya, “Ha enweghị mmanya.”
JOH 2:4 Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị gbasara mụ na gị na nke a? Oge awa m erubeghị.”
JOH 2:5 Nne ya gwara ndị na-eje ozi, “Ihe ọbụla ọ gwara unu, meenụ ya.”
JOH 2:6 A dọbara ite mmiri nkume isii buru ibu nʼakụkụ ebe ahụ, nke a na-eji agbanye mmiri ndị Juu na-eji asachasị onwe ha ma ha chọọ ikpe ekpere. Otu nʼime ha na-eri ihe dị ka galọọnụ iri abụọ ma ihe ruru iri atọ.
JOH 2:7 Jisọs gwara ha, “Gbajuonụ ite ndị a mmiri.” Ya mere, ha gbajupụtara ha mmiri.
JOH 2:8 Mgbe ahụ, ọ gwara ha, “Ugbu a, gbapụtanụ ụfọdụ bugara onyeisi oche.” Ha mekwara nke a.
JOH 2:9 Mgbe ahụ onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ. Ọ mataghị ebe o siri pụta (ma ndị na-eje ozi, ndị kutere mmiri ahụ matara), onyeisi oche ahụ kpọpụtara onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ iche
JOH 2:10 sị ya, “Nʼoge mmemme ọbụla, a na-ebu ụzọ buputa mmanya dị ụtọ, ma bupụtakwa nke na-adịghị ụtọ nʼikpeazụ, mgbe ndị mmadụ ṅụjuchara afọ, ma i chebere mmanya dị ụtọ buputa ya ugbu a.”
JOH 2:11 Nke a bụ mmalite ihe ama Jisọs mere na Kena nke Galili, o sitere na nke a kpughee ebube ya, ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya.
JOH 2:12 Mgbe nke a gasịrị, ọ gara Kapanọm, ya na nne ya na ụmụnne ya, nakwa ndị na-eso ụzọ ya. Ha nọrọ ụbọchị ole na ole nʼebe ahụ.
JOH 2:13 Mgbe mmemme oriri Ngabiga nke ndị Juu na-abịaru nso, Jisọs gara Jerusalem.
JOH 2:14 Nʼime ụlọnsọ ukwu, ọ hụrụ ndị na-ere ehi, na atụrụ na nduru. Hụkwa ndị nọdụrụ na tebul na-agbanwe ego.
JOH 2:15 Ya mere, o jiri eriri mere ụtarị chụpụsịa ndị niile nọ na-ere ahịa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, tinyekwara ehi na atụrụ ha. Ọ kwafusịrị mkpụrụ ego ndị ahụ na-agbanwe ego, kpugharịakwa tebul ha ihu.
JOH 2:16 Ọ sịrị ndị ahụ na-ere nduru, “Wepụnụ ihe ndị a nʼebe a. Kwụsịnụ ime ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ebe a na-azụ ahịa.”
JOH 2:17 Ndị na-eso ụzọ ya chetara na e dere ya rịị nʼakwụkwọ nsọ, “Ihe banyere ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi.”
JOH 2:18 Ma ndị Juu sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị pụrụ igosi anyị na ikike i ji eme ihe ndị a.”
JOH 2:19 Jisọs zara sị, “Kwatuonụ ụlọnsọ ukwu a, aga m ewughachikwa ya nʼabalị atọ.”
JOH 2:20 Ndị Juu kwuru, “Ụlọnsọ ukwu a were anyị iri afọ anọ na isii ịrụ ya, ị ga-ewughachi ya nʼabalị atọ?”
JOH 2:21 Ma ụlọnsọ o kwuru maka ya bụ ahụ ya.
JOH 2:22 Ndị na-eso ụzọ ya chetara okwu ya a mgbe o siri nʼọnwụ bilie. Mgbe ahụkwa, ha kweere akwụkwọ nsọ ya na okwu niile Jisọs kwuru.
JOH 2:23 Mgbe ọ nọ na Jerusalem nʼoge Mmemme Ngabiga, ọtụtụ mmadụ hụrụ ihe ịrịbama o mere kweere na ya.
JOH 2:24 Ma Jisọs atụkwasịghị ha obi nʼihi na ọ matara mmadụ niile nke ọma.
JOH 2:25 Ọ dịghị ya mkpa ka onye ọbụla gbaa akaebe banyere ụmụ mmadụ, nʼihi na ya onwe ya maara ihe dị nʼime mmadụ.
JOH 3:1 O nwere otu nwoke onyeisi ndị Juu nke so nʼotu ndị Farisii aha ya bụ Nikọdimọs.
JOH 3:2 Ọ bịakwutere ya nʼabalị sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye ozizi sitere na Chineke, nʼihi na o nweghị onye ọbụla pụrụ ịrụ ọrụ ebube dị otu a ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.”
JOH 3:3 Jisọs zara sị ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya.”
JOH 3:4 Nikọdimọs sịrị ya, “Olee otu a ga-esi mụgharịa mmadụ mgbe o mere okenye? Ọ ga-aba nʼafọ nne ya nke ugboro abụọ?”
JOH 3:5 Ma Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, o nweghị ike ịba nʼalaeze Chineke.
JOH 3:6 Ihe e si nʼanụ ahụ mụọ bụ anụ ahụ, ma ihe a mụrụ site na Mmụọ bụ mmụọ.
JOH 3:7 Ya ejula gị anya na m sịrị gị, ‘Agaghị ịmụ unu ọzọ.’
JOH 3:8 Ifufe na-efe nʼebe ọbụla masịrị ya. I nwere ike nụ ụzụ ya ma ịmataghị ebe o si abịa maọbụ ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dịkwara onye ọbụla a mụrụ site na Mmụọ.”
JOH 3:9 Nikọdimọs zara sị ya, “Olee otu ihe ndị a ga-esi mee?”
JOH 3:10 Jisọs zara sị ya, “Ị bụ onye ozizi ndị Izrel, ma ị ghọtaghị ihe ndị a?
JOH 3:11 Nʼezie, nʼezie agwa m unu. Anyị na-ekwu banyere ihe anyị maara, na-akọwapụtakwa ihe anyị hụrụ, ma unu onwe unu adịghị anabata akaebe anyị.
JOH 3:12 Ekwuola m banyere ihe dị nʼụwa ma unu ekweghị ya, oleekwanụ otu unu ga-esi kwere, ma ọ bụrụ na mụ agwa unu banyere ihe ndị dị nʼeluigwe?
JOH 3:13 O nwebeghị onye ọbụla rigooro nʼeluigwe ewezuga Nwa nke Mmadụ bụ onye siri nʼeluigwe rịdata.
JOH 3:14 Dị ka Mosis weliri agwọ elu nʼime ọzara, otu a ka a ga-ewelikwa Nwa nke Mmadụ elu.
JOH 3:15 Ka onye ọbụla kwere na ya nwee ndụ ebighị ebi.”
JOH 3:16 Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.
JOH 3:17 Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa.
JOH 3:18 Ikpe amaghị onye ọbụla kwere na ya, ma onye ọbụla na-ekweghị aghọọlarị onye ikpe mara, nʼihi na o kweghị nʼaha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.
JOH 3:19 Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ.
JOH 3:20 Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwute ìhè ahụ, ka a ghara ime ka ọrụ ya pụta ìhè.
JOH 3:21 Ma ndị na-ebi ndụ nʼeziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e nwee ike hụta ya nke ọma, na ihe niile ha na-eme sitere na ike Chineke.
JOH 3:22 Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime obodo Judịa, ebe ọ nọtụrụ nwa oge, meekwa baptizim.
JOH 3:23 Nʼotu aka ahụ, Jọn nọkwa nʼọnụ mmiri Enọn dị nso na Salim na-eme baptizim nʼihi na mmiri buru ibu nʼebe ahụ, ndị mmadụ gakwara nʼihu na-abịakwute ya, ọ na-emekwa ha baptizim.
JOH 3:24 E tinyebeghị Jọn nʼụlọ mkpọrọ mgbe ahụ.
JOH 3:25 Nʼoge a, ịrụrịta ụka malitere nʼetiti ndị na-eso ụzọ Jọn na otu onye Juu banyere mmemme ịdị ọcha.
JOH 3:26 Ha bịakwutere Jọn sị ya, “Onye ozizi, onye ahụ ị gbara ama banyere ya nọ nʼofe Jọdan na-eme baptizim, mmadụ niile na-agakwukwara ya.”
JOH 3:27 Jọn zaghachiri sị, “Ihe mmadụ nwere ike ịnata bụ naanị ihe ahụ e nyere ya site nʼeluigwe.
JOH 3:28 Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m sịrị, na abụghị m Kraịst ahụ, kama e zitere m ka m buru ụzọ bịa.
JOH 3:29 Nwanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nke di ya. Enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-eche ma na-egekwa ntị ịnụ olu ya, ọṅụ na-ejupụtakwa ya obi mgbe ọ nụrụ olu onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ. Ya mere, ọṅụ m e zuola oke ugbu a.
JOH 3:30 Ọ ghaghị ịdị elu, ma mụ onwe m aghaghị ịdịkwa ala.
JOH 3:31 “Onye ahụ si nʼelu bịa dị elu karịa ihe niile, onye ahụ si nʼụwa bụkwa nke ụwa ma na-ekwukwa okwu dị ka onye si nʼụwa. Onye ahụ si nʼeluigwe dị elu karịa ihe niile.
JOH 3:32 Ọ na-agba ama banyere ihe ọ hụrụ nakwa nke ọ nụrụ, ma o nweghị onye na-anabata ama ya.
JOH 3:33 Onye ọbụla nabatara akaebe ya ji nke a mere akara, na Chineke bụ eziokwu.
JOH 3:34 Nʼihi na onye Chineke zitere na-ekwu okwu Chineke. Nʼihi na ọ na-enye Mmụọ ya nʼuju.
JOH 3:35 Nna hụrụ Ọkpara ya nʼanya, o tinyekwala ihe niile nʼaka ya.
JOH 3:36 Onye ọbụla kwere nʼỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi, ma onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ nʼihi na iwe Chineke ga-adịrị ya.”
JOH 4:1 Ugbu a, Jisọs matara na ndị Farisii anụla na ọ na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya na-emekwa baptizim karịa Jọn.
JOH 4:2 Ma ọ bụkwaghị Jisọs na onwe ya na-eme baptizim kama ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya mere ha baptizim.
JOH 4:3 Ọ hapụrụ Judịa laghachi azụ na Galili.
JOH 4:4 Ma ọ ga-esite nʼetiti Sameria gafee.
JOH 4:5 Ya mere, ọ batara nʼotu obodo nta dị na Sameria a na-akpọ Saika, nʼakụkụ ala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya nwoke.
JOH 4:6 Olulu mmiri Jekọb dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na ike gwụrụ Jisọs nʼije ya, ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ olulu mmiri ahụ. Ọ bụ ihe dị ka oge ehihie.
JOH 4:7 Otu nwanyị onye Sameria bịara ịdọrọ mmiri, Jisọs sịrị ya, “Nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.”
JOH 4:8 (Ndị na-eso ụzọ ya abaala nʼime obodo ịga zụta nri.)
JOH 4:9 Nwanyị ahụ sịrị ya, “Olee otu gị bụ onye Juu si arịọ m bụ nwanyị Sameria mmiri ka ị ṅụọ?” (Nʼihi na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọrịta ihe ọbụla.)
JOH 4:10 Jisọs zara sị, “Ọ bụrụ na ị matara onyinye Chineke, na onye ahụ na-arịọ gị mmiri, ị gaara arịọ ya, ọ gakwara enye gị mmiri nke ndụ.”
JOH 4:11 Nwanyị ahụ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, o nweghị ihe ọbụla i ji ị ga-eji dọrọ mmiri, olulu a dịkwa omimi. Oleekwanụ ebe ị ga-eweta mmiri ndụ a.
JOH 4:12 Ọ bụ na ị ka nna nna anyị Jekọb ukwuu, onye gwuuru anyị olulu mmiri a? Ya onwe ya na ụmụ ya na igwe ehi na atụrụ ya ṅụkwara mmiri sitere na ya?”
JOH 4:13 Jisọs zara sị, “Onye ọbụla ṅụrụ mmiri a, akpịrị ga-akpọ ya nkụ ọzọ.
JOH 4:14 Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.”
JOH 4:15 Mgbe ahụ nwanyị ahụ sịrị ya, “Onyenwe anyị nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ, ka m gharakwa ịdị na-abịa ebe a ịdọrọ mmiri.”
JOH 4:16 Ọ gwara ya sị, “Gaa kpọta di gị ma lọghachi.”
JOH 4:17 Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “Enweghị m dị.” Jisọs sịrị ya, “I kwuru eziokwu mgbe ị sịrị na i nweghị di.
JOH 4:18 I nweela di ise, ma nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ihe kwuru bụ nnọọ eziokwu.”
JOH 4:19 Nwanyị ahụ sịrị ya “Nna anyị ukwu, ahụrụ m na ị bụ onye amụma.
JOH 4:20 Nna nna anyị ha fere ofufe nʼugwu a, ma unu na-ekwu nʼebe ndị mmadụ ga-eferịrị ofufe bụ naanị na Jerusalem.”
JOH 4:21 Jisọs sịrị ya, “Nwanyị kwere okwu m, oge na-abịa mgbe ị na-agaghị akpọ isiala nye Nna, maọbụ nʼugwu a ma ọ bụkwanụ na Jerusalem.
JOH 4:22 Unu na-efe ihe unu na-amaghị ma anyị na-efe ihe anyị matara, nʼihi na nzọpụta sitere nʼaka ndị Juu.
JOH 4:23 Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya.
JOH 4:24 Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu.”
JOH 4:25 Nwanyị ahụ sịrị ya, “Amaara m na Mezaya” (onye a na-akpọ Kraịst) “na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwaziri anyị ihe niile.”
JOH 4:26 Jisọs sịrị ya, “Mụ, onye na-agwa gị okwu, abụ m ya.”
JOH 4:27 Nʼoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya lọghachitara. Ọ gbagwojukwara ha anya nke ukwuu ịhụ na ya na nwanyị na-ekwurịta okwu. Ma o nweghị onye nʼime ha jụrụ nwanyị ahụ sị, “Gịnị ka ị chọrọ?” ma ọ bụkwanụ, “Gịnị kpatara gị na ya ji na-ekwurịta okwu?”
JOH 4:28 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya laghachi nʼime obodo ga gwa ndị mmadụ,
JOH 4:29 “Bịanụ lee otu nwoke onye gwara m ihe niile m merela. Ọ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst ahụ?”
JOH 4:30 Ha sitere nʼobodo ahụ gbapụtasịa soro ụzọ ahụ, ka ha gakwuru ya.
JOH 4:31 Ma otu ọ dị, ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ya sị, “Onye ozizi rienụ nri.”
JOH 4:32 Ma ọ sịrị ha, “Enwere m nri m na-eri nke unu na-amaghị maka ya.”
JOH 4:33 Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Ọ ga-abụ na o nwere onye butere ya nri?”
JOH 4:34 Jisọs sịrị ha, “Nri m bụ ime uche onye ahụ zitere m nakwa ịrụcha ọrụ ya.
JOH 4:35 Unu na-asị, ‘ọ fọdụghị ọnwa anọ ka ịghọ mkpụrụ nʼubi ruo?’ Ma ana m agwa unu, megheenụ anya unu lee ubi ahụ, ha achaala maka ọghụghọ.
JOH 4:36 Ọ bụladị ugbu a, onye na-aghọ mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ, ọ na-achịkọta mkpụrụ ahụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ na onye ghọrọ ya nwee ike ịṅụrịkọta ọṅụ.
JOH 4:37 Ya mere okwu ahụ nke na-asị, ‘Otu onye na-agha mkpụrụ, onye ọzọ na-aghọkwa ya bụ eziokwu.’
JOH 4:38 E zigara m unu ka unu gaa ghọta ihe unu na-arụghị ọrụ maka ya. Ndị ọzọ rụrụ ọrụ a, ma unu ewe uru dị nʼọrụ ha.”
JOH 4:39 Ọtụtụ ndị obodo Sameria kweere na ya nʼihi ama ahụ nwanyị ahụ gbara, “Ọ gwara m ihe niile m mere.”
JOH 4:40 Ya mere mgbe ndị Sameria bịakwutere ya, ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụrụ ha, ọ nọnyekwaara ha ụbọchị abụọ.
JOH 4:41 Ọtụtụ ndị ọzọ kwerekwara na ya nʼihi okwu ya.
JOH 4:42 Ha gwara nwanyị ahụ, “Ihe anyị jiri kwere ugbu a abụghị ihe i kwuru, kama ọ bụ nʼihi na anyị onwe anyị anụla olu ya, matakwa na onye a bụ Onye nzọpụta nke ụwa nʼeziokwu.”
JOH 4:43 Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gasịrị, ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili.
JOH 4:44 (Jisọs nʼonwe ya ekwuola na onye amụma anaghị enwe ugwu nʼobodo ya.)
JOH 4:45 Mgbe ọ bịaruru Galili, ndị Galili nabatara ya ebe ha onwe ha gara mmemme na Jerusalem, ma hụkwa ọtụtụ ọrụ ebube ọ rụrụ nʼoge mmemme ahụ.
JOH 4:46 Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm.
JOH 4:47 Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ.
JOH 4:48 Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị.”
JOH 4:49 Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.”
JOH 4:50 Jisọs sịrị ya, “Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa.
JOH 4:51 Mgbe ọ ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma.
JOH 4:52 Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, “Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie.”
JOH 4:53 Nwoke ahụ ghọtara na ọ bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya, “Nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere.
JOH 4:54 Nke a bụ ihe ịrịbama nke abụọ Jisọs rụrụ na Galili mgbe o siri Judịa bịa.
JOH 5:1 Mgbe nke a gasịrị, otu mmemme ndị Juu ruru, Jisọs agaa Jerusalem.
JOH 5:2 Ma otu ọdọ mmiri nta dị nʼime Jerusalem nʼakụkụ Ọnụ ụzọ ama Atụrụ. Aha ọdọ mmiri ahụ nʼasụsụ Hibru bụ Betsaida, nke nwere mgbe ọnụ ụzọ ise.
JOH 5:3 Nʼime ya ka igwe ndị ahụ na-esighị ike na-edina; ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ha na-eche mgbe mmiri ahụ ga-enugharị.
JOH 5:4 Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agbadata site na mgbe ruo na mgbe gbarụọ mmiri ahụ. Onye ọrịa ọbụla buru ụzọ daba nʼime mmiri ahụ ma a gbarụọ ya, ka a na-agwọ ihe ọbụla bụ ọrịa ya.
JOH 5:5 Otu nwoke nọ nʼebe ahụ bụ onye nọrọla nʼọrịa iri afọ atọ na asatọ.
JOH 5:6 Mgbe Jisọs hụrụ ya, matakwa na ọ nọọla nʼọnọdụ a ogologo oge, ọ jụrụ ya sị, “Ị chọrọ ka a gwọọ gị ọrịa?”
JOH 5:7 Onye ọrịa ahụ zara, “Nna m ukwu, enweghị m onye ọbụla ga-enyere m aka kuba m nʼime ọdọ mmiri a ma a gbarụọ ya, mgbe o bụla m chọrọ ka m danye, onye ọzọ na-eburu m ụzọ danye.”
JOH 5:8 Jisọs gwara ya, “Bilie, chilie ute gị jegharịa.”
JOH 5:9 Nʼotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma, ọ chịlịri ute ya, malite ijegharị. Ihe a mere nʼụbọchị izuike.
JOH 5:10 Ma ndị Juu gwara nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa, “Taa bụ ụbọchị izuike, o megidere iwu na ị ga-ebu ute gị.”
JOH 5:11 Ma ọ zaghachiri ha, “Nwoke ahụ mere ka ahụ dị m mma sịrị m, ‘Chilie ute gị laa.’ ”
JOH 5:12 Ha jụrụ ya, “Onye bụ onye ahụ gwara gị ka ị chilie ya laa?”
JOH 5:13 Ma nwoke ahụ a gwọrọ amataghị onye ọ bụ nʼihi na Jisọs zoro onwe ya banye nʼetiti igwe mmadụ.
JOH 5:14 Emesịa, Jisọs hụrụ ya nʼime ụlọnsọ ukwu sị ya, “Lee, e mela ka ahụ dị gị mma, emehiekwala ọzọ ka nke dị njọ karịa nke a hapụ ịbịakwasị gị.”
JOH 5:15 Nwoke a siri nʼebe ahụ pụọ gaa gwa ndị Juu na ọ bụ Jisọs gwọrọ ya.
JOH 5:16 Ya mere, nʼihi na Jisọs na-eme ihe ndị a nʼụbọchị izuike, ndị Juu malitere isogbu ya.
JOH 5:17 Jisọs sịrị ha, “Nna m na-arụ ọrụ mgbe niile ruo ugbu a, mụ onwe m kwa, ana m arụ ọrụ.”
JOH 5:18 Nʼihi nke a, ndị Juu chọsịrị ike igbu ya. Ọ bụghị naanị na o mebiri ụbọchị izuike, kama ọ na-akpọkwa Chineke Nna ya, sitekwa otu a na-eme ka ya na Chineke hara.
JOH 5:19 Jisọs zara ha sị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, o nweghị ihe ọbụla Ọkpara pụrụ ime nʼonwe ya; naanị ihe o nwere ike ime bụ ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme, nʼihi na ihe ọbụla Nna ahụ na-eme ka Ọkpara ya na-emekwa.
JOH 5:20 Nʼihi na Nna ahụ hụrụ Ọkpara ya nʼanya ma na-egosikwa ya ihe niile ọ na-eme. Nʼezie ọ ga-agbagwoju unu anya nʼihi na ọ ga-egosi ya ihe karịrị ndị a.
JOH 5:21 Nʼihi na dị ka nna ahụ si akpọte ndị nwụrụ anwụ na-enyekwa ha ndụ, otu ahụ ka Ọkpara ya si enye onye ọbụla ọ masịrị ya ndụ.
JOH 5:22 Nna anaghị ekpe onye ọbụla ikpe, kama o nyefere ikpe niile nʼaka Ọkpara.
JOH 5:23 Ka mmadụ niile nye Ọkpara ahụ nsọpụrụ dị ka ha na-asọpụrụ Nna ahụ. Onye ọbụla nke na-adịghị asọpụrụ Ọkpara ahụ adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya.
JOH 5:24 “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ.
JOH 5:25 Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ.
JOH 5:26 Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya.
JOH 5:27 O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na ọ bụ Nwa nke Mmadụ.
JOH 5:28 “Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya
JOH 5:29 ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe.
JOH 5:30 Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.
JOH 5:31 “Ọ bụrụ na m na-agba ama banyere onwe m, ama m abụghị eziokwu.
JOH 5:32 Enwere m onye ọzọ na-agbara m ama, amatakwara m na ama ya banyere m bụ eziokwu.
JOH 5:33 “Unu zigaara Jọn ndị ozi, ọ gbakwaala ama maka eziokwu ahụ.
JOH 5:34 Ọ bụghị na m na-anabata ama nke mmadụ, kama a na m ekwu ya ka enwe ike ịzọpụta unu.
JOH 5:35 Ọ bụ oriọna nke na-enwu na-amụkekwa, unu họrọkwara ịṅụrị ọṅụ nʼìhè ya nʼoge nta.
JOH 5:36 “Ma e nwere m ama dị ukwuu karịa nke Jọn, nʼihi na ọrụ ahụ ya bụ Nna nyere m ka m rụchapụ, bụkwa nke m na-arụ, na-agbara m ama na ọ bụ Nna ahụ zitere m.
JOH 5:37 Ya bụ Nna ahụ zitere m na-agbakwa ama nʼonwe ya banyere m. Unu anụbeghị olu maọbụ hụ ụdịdị ya.
JOH 5:38 Okwu ya anọkwaghị nʼime unu nʼihi na unu ekweghị nʼonye o zitere.
JOH 5:39 Unu na-enyocha akwụkwọ nsọ nʼihi na unu chere na unu ga-esite na ha nwee ndụ ebighị ebi maọbụ ha na-agba ama banyere m.
JOH 5:40 Ma unu jụrụ ịbịakwute m ka unu nwee ndụ.
JOH 5:41 “Anaghị m anabata otuto nke ụmụ mmadụ.
JOH 5:42 Ma amatara m na unu enweghị ịhụnanya Chineke nʼobi unu.
JOH 5:43 Abịala m nʼaha Nna m ma unu anabataghị m. Ma ọ bụrụ na onye ọzọ abịa nʼaha nke onwe ya, unu ga-anabata ya.
JOH 5:44 Olee otu unu ga-esi kwere ebe unu na-anara otuto site nʼaka ibe unu, ma unu adịghị achọ otuto nke si nʼaka onye naanị ya bụ Chineke?
JOH 5:45 “Unu echela na m ga-ebo unu ebubo nʼihu Nna ahụ. Onye ga-ebo unu ebubo bụ Mosis, bụ onye unu tụkwasịrị obi na ya.
JOH 5:46 Ọ bụrụ na unu kwenyeere Mosis, unu gakwara ekwere na m, nʼihi na o dere banyere m.
JOH 5:47 Ma ebe unu na-ekweghị nʼihe o dere, olee otu unu ga-esi kwere nʼihe m kwuru?”
JOH 6:1 Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gafere nʼofe nke ọzọ nke osimiri Galili (nke a na-akpọkwa osimiri Tiberịas).
JOH 6:2 Oke igwe mmadụ sooro ya, nʼihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ na-arụ nʼahụ ndị ọrịa.
JOH 6:3 Jisọs rigooro nʼelu ugwu nọdụ ala ya na ndị na-eso ụzọ ya.
JOH 6:4 Nʼoge a, mmemme oriri Ngabiga ndị Juu na-abịa nso.
JOH 6:5 Mgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, ọ sịrị Filip, “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?”
JOH 6:6 Ọ jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ọ ga-eme.
JOH 6:7 Filip zara ya, “Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị.”
JOH 6:8 Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara,
JOH 6:9 “Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?”
JOH 6:10 Jisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise.
JOH 6:11 Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ.
JOH 6:12 Mgbe ha niile rijuchara afọ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi.”
JOH 6:13 Ya mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ.
JOH 6:14 Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.”
JOH 6:15 Mgbe Jisọs matara na ha chọrọ ịbịa dọkpụrụ ya nʼike chie ya eze, ọ hapụrụ ha ga nʼugwu naanị ya, nʼonwe ya.
JOH 6:16 Mgbe o ruru nʼuhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya rịdara gaa nʼọnụ mmiri,
JOH 6:17 ebe ha banyere nʼotu ụgbọ mmiri, malite ịgabiga osimiri gawa nʼofe Kapanọm. Nʼoge a ọchịchịrị agbaala ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha.
JOH 6:18 Ebili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe.
JOH 6:19 Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka kilomita ise maọbụ isii, mgbe ha hụrụ Jisọs ka ọ na-aga ije nʼelu mmiri ahụ na-abịa nso nʼụgbọ mmiri ha. Oke egwu tụkwara ha.
JOH 6:20 Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m.”
JOH 6:21 Mgbe ahụ, ha nabatara ya nʼime ụgbọ ahụ, ọ dịkwaghị anya ụgbọ ha bịaruru nʼelu ala ebe ha na-aga.
JOH 6:22 Nʼechi ya, igwe mmadụ ahụ nọdụrụ nʼofe ọzọ nke ọnụ mmiri ahụ chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụgbọ mmiri nta bịara nʼebe ahụ, na Jisọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye nʼime ya, kama na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya ka ụgbọ mmiri ahụ buuru pụọ.
JOH 6:23 Mgbe ahụ ụfọdụ ụgbọ mmiri si Tiberịas bịara kwụsị nso nso ebe ahụ ndị mmadụ nọ rie achịcha mgbe Onyenwe anyị nyechara ekele maka ya.
JOH 6:24 Ma mgbe igwe mmadụ ahụ ghọtara na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị nʼebe ahụ, ha banyere nʼụgbọ mmiri nta ndị ahụ kwọfee gawa Kapanọm ịchọ Jisọs.
JOH 6:25 Mgbe ha hụrụ ya nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya, “Onye ozizi, olee mgbe i jiri bịa nʼebe a?”
JOH 6:26 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ihe unu ji na-achọ m abụghị nʼihi na unu hụrụ ihe ịrịbama m mere, kama na unu riri achịcha rijuokwa afọ.
JOH 6:27 Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.”
JOH 6:28 Mgbe ahụ, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?”
JOH 6:29 Jisọs zara sị ha, “Ọrụ Chineke bụ nke a, ikwere nʼonye ahụ o zitere.”
JOH 6:30 Ya mere ha sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị ga-egosi anyị nke anyị ga-ahụ ma kwere na gị? Kedụ ọrụ ị ga-arụ?
JOH 6:31 Nna nna anyị ha riri mánà nʼọzara; dị ka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘O sitere nʼeluigwe nye ha achịcha ka ha rie.’”
JOH 6:32 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụghị Mosis nyere unu achịcha ahụ site nʼeluigwe, kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi achịcha ahụ site nʼeluigwe.
JOH 6:33 Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ.”
JOH 6:34 Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa.”
JOH 6:35 Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.
JOH 6:36 Ma agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa.
JOH 6:37 Onye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya.
JOH 6:38 Nʼihi na esi m nʼeluigwe rịdata nʼụwa ime uche onye ahụ zitere m, ọ bụghị ime uche nke m.
JOH 6:39 Nke a bụkwa uche onye ahụ zitere m, na o nweghị onye ọbụla o nyere m ga-efunarị m, kama m ga-eme ka ha site nʼọnwụ bilie nʼụbọchị ikpeazụ.
JOH 6:40 Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.”
JOH 6:41 Nʼihi nke a, ndị Juu bidoro itamu ntamu megide ya nʼihi na ọ sịrị, “Abụ m achịcha ahụ siri nʼeluigwe rịdata.”
JOH 6:42 Ha sịrị, “Onye a ọ bụghị Jisọs, nwa Josef, bụ onye anyị matara nne na nna ya? Oleekwanụ otu o si ekwu ugbu a sị, ‘Esi m nʼeluigwe rịdata’?”
JOH 6:43 Jisọs zara sị ha, “Unu atamula nʼetiti onwe unu.
JOH 6:44 O nweghị onye nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụghị na Nna ahụ zitere m kpọtara ya, aga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ.
JOH 6:45 E dere ya nʼakwụkwọ ndị amụma, ‘Ha niile ga-abụ ndị Chineke ga-akụziri ihe.’Onye ọbụla nke gere Nna ahụ ntị ma mụtakwa ihe site na ya na-abịakwute m.
JOH 6:46 O nweghị onye ọbụla hụrụla Nna ahụ karịakwa onye ahụ sitere na Chineke, naanị ya hụrụla Nna ahụ.
JOH 6:47 Nʼeze, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi.
JOH 6:48 Abụ m achịcha nke ndụ.
JOH 6:49 Nna nna unu ha riri mánà ahụ nʼime ọzara ma mecha nwụọ.
JOH 6:50 Ma nke a bụ achịcha ahụ nke si nʼeluigwe bịa, nke mmadụ pụrụ iri ma ghara ịnwụ anwụ.
JOH 6:51 Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.”
JOH 6:52 Mgbe ahụ, ndị Juu bidoro na-arụrịta ụka ike nʼetiti onwe ha sị, “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyị anụ ahụ ya ka anyị rie?”
JOH 6:53 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, naanị ma unu riri anụ ahụ Nwa nke Mmadụ ma ṅụọkwa ọbara ya, unu agaghị enwe ndụ nʼime onwe unu.
JOH 6:54 Onye ọbụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. A ga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ ahụ.
JOH 6:55 Nʼihi na anụ ahụ m bụ ezigbo nri, ọbara m bụkwa ezigbo ihe ọṅụṅụ.
JOH 6:56 Onye ọbụla na-eri anụ ahụ m na-aṅụkwa ọbara m na-anọgide nʼime m mụ onwe m kwa nʼime ya.
JOH 6:57 Dị ka Nna ahụ dị ndụ zitere m, ana m adịkwa ndụ nʼihi Nna ahụ, otu a ka onye na-eri m ga-adịkwa ndụ site na m.
JOH 6:58 Nke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
JOH 6:59 O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-akụzi ihe nʼụlọ ekpere dị na Kapanọm.
JOH 6:60 Mgbe ọtụtụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya ha nụrụ nke a, ha sịrị, “Nke a bụ ozizi siri ike, onye nwere ike ịnabata ya?”
JOH 6:61 Ebe Jisọs matara na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu maka nke a ọ sịrị ha, “Nke a ọ na-ewute unu?
JOH 6:62 Gịnị ka unu ga-ekwu ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-arịgo ebe ọ nọrịị na mbụ.
JOH 6:63 Ọ bụ Mmụọ ahụ na-enye ndụ; anụ ahụ abaghị uru ọbụla, okwu ndị m gwara unu bụ mmụọ bụrụkwa ndụ.
JOH 6:64 Ma nʼetiti unu, ọ dị ụfọdụ na-ekwenyeghị.” Nʼihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ nʼime ha na-ekwenyeghị, matakwa onye ahụ nke ga-arara ya nye.
JOH 6:65 Ọ sịrị, “Ọ bụ nke a mere m jiri gwa unu na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike.”
JOH 6:66 Nʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya.
JOH 6:67 Jisọs sịrị mmadụ iri na abụọ ahụ, “Unu chọkwara iso ha pụọ?”
JOH 6:68 Saimọn Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.
JOH 6:69 Anyị kweere marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”
JOH 6:70 Jisọs zara ha, “Ọ bụghị m họpụtara unu mmadụ iri na abụọ? Ma otu onye nʼime unu bụ ekwensu!”
JOH 6:71 Ọ na-ekwu banyere Judas nwa Saimọn Iskarịọt, onye nʼagbanyeghị na ọ bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ, bụ onye ga-arara ya nye.
JOH 7:1 Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gagharịrị na Galili, ma ọ kpachapụrụ anya hapụ ịga Judịa nʼihi na ndị Juu na-achọ ụzọ igbu ya.
JOH 7:2 Mmemme Ụlọ ikwu ndị Juu dị nso,
JOH 7:3 ya mere, ụmụnne ya ndị nwoke sịrị ya, “Si nʼebe a pụọ, gaa Judịa, ka ndị na-eso ụzọ gị nwe ike ịhụ ọrụ ị na-arụ.
JOH 7:4 Nʼihi na o nweghị onye ọbụla chọrọ ịbụ onye ọha mmadụ ma, nke na-eme ihe na nzuzo. Ebe ọ bụkwanụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.”
JOH 7:5 Nʼihi na ọ bụladị ụmụnne ya ekwenyeghị na ya.
JOH 7:6 Jisọs sịrị ha, “Oge nke m erubeghị, ma oge nke unu nọ nʼebe a mgbe niile.
JOH 7:7 Ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị nʼihi na ana m agba ama megide ya nʼọrụ ya jọrọ njọ.
JOH 7:8 Unu onwe unu gaanụ na mmemme ahụ, agaghị m aga mmemme a nʼihi na oge m erubeghị.”
JOH 7:9 Mgbe o kwusiri nke a, ọ nọgidere na Galili.
JOH 7:10 Ma otu ọ dị, mgbe ụmụnne ya gawara mmemme ahụ ya onwe ya gakwara. Ọ gaghị ebe mmadụ niile ga-ahụ ya kama ọ gara na nzuzo.
JOH 7:11 Na mmemme ahụ ndị Juu nọ na-ele anya ma na-ajụgharị sị, “Olee ebe ọ nọ?”
JOH 7:12 E nwere oke ntamu nʼetiti igwe mmadụ ahụ banyere ya. Ndị ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ndị ọzọ na-asị, “Mba, ọ na-eduhie igwe mmadụ.”
JOH 7:13 Ma o nweghị onye ọbụla kwulitere okwu maka ya nʼihu ọha nʼihi egwu ndị Juu.
JOH 7:14 Mgbe o ruru nʼetiti mmemme ahụ, Jisọs banyere nʼime ụlọnsọ ukwu ma bido ikuzi ihe.
JOH 7:15 Site nʼoke mgbagwoju anya, ndị Juu jụrịtara onwe ha sị, “Olee otu nwoke a sịrị nweta amamihe dị otu a ebe ọ bụ na o nwebeghị onye kuziri ya ihe ọbụla?”
JOH 7:16 Jisọs zara ha, “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye ahụ zitere m.
JOH 7:17 Onye ọbụla na-achọ ime uche Chineke, ọ ga-achọpụta ma ozizi m ọ bụ nke m ma o sikwanụ na Chineke.
JOH 7:18 Ndị ahụ na-ekwu nke onwe ha na-eme nke a iji wetara onwe ha ugwu, ma onye ahụ na-achọ ugwu nke onye zitere ya bụ onye eziokwu; o nwekwaghị ihe ọbụla bụ ụgha banyere ya.
JOH 7:19 Mosis o nyeghị unu iwu? Ma o nweghị onye ọbụla nʼime unu na-edebe iwu ahụ. Gịnị mere unu ji achọ igbu m?”
JOH 7:20 Igwe mmadụ ahụ zara, “Mmụọ ọjọọ bi nʼime gị, onye chọrọ igbu gị?”
JOH 7:21 Jisọs zara sị ha, “Arụrụ m otu ọrụ, ma unu niile nọ na mgbagwoju anya.
JOH 7:22 Mosis nyere unu iwu ibi ugwu (nʼagbanyeghị na o siteghị na Mosis, kama na nna nna anyị ha), nʼụbọchị izuike unu na-ebikwa mmadụ ugwu.
JOH 7:23 Ọ bụrụ na e nwere ike bie mmadụ ugwu nʼụbọchị izuike ka a ghara imebi iwu Mosis, gịnị mere o ji na-ewute unu na m mere ka ahụ mmadụ zuo oke nʼụbọchị izuike?
JOH 7:24 Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”
JOH 7:25 Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị Jerusalem bidoro na-asị, “Onye a ọ bụghị nwoke ahụ ha chọrọ igbu?
JOH 7:26 Lee ka ọ nọ na-ekwu okwu nʼihu mmadụ niile ma o nwekwaghị onye na-agwa ya ihe ọbụla. Ọ pụtara na ndịisi amatala nʼeziokwu na ọ bụ Kraịst?
JOH 7:27 Ma anyị matara ebe nwoke a siri pụta, mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, o nweghị onye ga-amata ebe o siri pụta.”
JOH 7:28 Ma dị ka Jisọs na-ezi ihe nʼime ụlọnsọ ukwuu ahụ, o tiri mkpu sị, “Nʼezie, unu maara m, matakwa ebe m siri pụta. Anọghị m nʼebe a na nke onwe m, ma onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Unu amaghị ya.
JOH 7:29 Ma amara m ya, nʼihi na esitere m na ya bịa. Ọ bụkwa ya zitere m.”
JOH 7:30 Mgbe ahụ ha chọrọ ijide ya, ma o nweghị onye ọbụla metụrụ ya aka nʼihi na oge ya erubeghị.
JOH 7:31 Ma otu ọ dị, ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ kweere na ya. Ha sịrị, “Mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, ọ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị ndị a nwoke a rụrụla?”
JOH 7:32 Ndị Farisii nụrụ ka igwe mmadụ ahụ na-atamu ntamu nʼolu nta banyere ya. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja na ndị Farisii zigara ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwuu ahụ ka ha gaa jide ya.
JOH 7:33 Jisọs sịrị, “Naanị nwa oge ka mụ na unu ga-anọ, aga m alakwurukwa onye zitere m.
JOH 7:34 Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.”
JOH 7:35 Ndị Juu sịrịtara onwe ha, “Olee ebe nwoke a chọrọ ịga anyị na-agaghị achọta ya? Ọ ga-eje ebe ndị nke anyị a chụsasịrị achụsasị bi nʼetiti ndị Griik, ka ọ ga kuziere ndị Griik ihe?
JOH 7:36 Kedụ ụdị okwu bụ nke a ọ na-ekwu sị, ‘Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m,’ na ‘Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru’?”
JOH 7:37 Nʼụbọchị ikpeazụ bụkwa ụbọchị kacha ibe ya nke mmemme ahụ, Jisọs guzooro ọtọ jiri oke olu tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọbụla nkụ, ya bịakwute m bịa ṅụrụ mmiri.
JOH 7:38 Onye ọbụla kweere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwururị, isi iyi mmiri nke ndụ ga na-asọpụta site nʼime afọ ya.”
JOH 7:39 O kwuru nke a banyere Mmụọ ahụ ndị kwere na ya ga-anata. Tutu ruo oge ahụ, e nyebeghị Mmụọ ahụ, nʼihi na e nyebeghị Jisọs otuto.
JOH 7:40 Mgbe ha nụrụ nke a, ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị, “Nʼeziokwu onye a bụ onye amụma ahụ.”
JOH 7:41 Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ Kraịst ahụ.” Ma ndị nke ọzọ sịkwara, “Nʼezie Kraịst ahụ, ọ ga-esi na Galili pụta?
JOH 7:42 Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?”
JOH 7:43 Ya mere nkewa dapụtara nʼetiti igwe mmadụ ahụ nʼihi ya.
JOH 7:44 Ụfọdụ chọrọ ijide ya ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka.
JOH 7:45 Mgbe ahụ, ndị nche ụlọnsọ ukwu lọghachiri nʼebe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nọ, ndị sịrị ha, “Gịnị mere unu akpụtaghị ya?”
JOH 7:46 Ha zara, “Anyị ahụbeghị onye kwuru okwu dị ka nwoke a.”
JOH 7:47 Ndị Farisii zara ha, “Unu esorola bụrụ ndị a ghọgburu?
JOH 7:48 Ọ dị onye ọbụla nʼime ndịisi maọbụ nʼime ndị Farisii tụkwasịrị ya obi?
JOH 7:49 E e! Kama igwe mmadụ ndị a na-amaghị iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ.”
JOH 7:50 Nikọdimọs, otu nʼime ha bụ onye bịakwutere ya na mbụ sịrị ha,
JOH 7:51 “Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ nụta okwu nʼọnụ ya, ịchọpụta ihe onye ahụ na-eme?”
JOH 7:52 Ha zaghachiri ya sị, “Gị onwe gị, i sokwa na ndị si Galili pụta? Nyochaa nke ọma, ị ga-achọpụta na onye amụma ọbụla agaghị esi na Galili pụta.”
JOH 7:53 Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime ha lara nʼụlọ ya.
JOH 8:1 Ma Jisọs rigooro nʼUgwu Oliv.
JOH 8:2 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ọ bịara ọzọ nʼụlọnsọ ukwuu ebe ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya. Ọ nọdụrụ ala malite ikuziri ha ihe.
JOH 8:3 Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile.
JOH 8:4 Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko.
JOH 8:5 Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?”
JOH 8:6 Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo. Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala.
JOH 8:7 Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, “Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume.”
JOH 8:8 Ọzọ, o hulatakwara ala malite ide ihe ọ na-ede nʼala.
JOH 8:9 Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, ọ fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya.
JOH 8:10 Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, “Nwanyị, oleekwanụ ha? Ọ dịghị onye mara gị ikpe?”
JOH 8:11 Ọ sịrị, “O nweghị onye ọbụla Onyenwe anyị.” Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe: Gawa, kama emehiekwala ọzọ.”
JOH 8:12 Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.”
JOH 8:13 Ndị Farisii sịrị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị abụghị ezie.”
JOH 8:14 Ma Jisọs zara sị, “A sịkwarị na mụ na-agbara onwe m ama, ama m na-agba bụ eziokwu. Nʼihi na-amara m ebe m si bịa, marakwa m ebe m na-aga. Ma unu aghọtaghị ebe m si bịa, maọbụ ebe m na-aga.
JOH 8:15 Unu na-ekpe ikpe dị ka mmadụ; ma ekpeghị m onye ọbụla ikpe.
JOH 8:16 Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m.
JOH 8:17 E dere nʼiwu unu sị, ‘ama mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’
JOH 8:18 Ana m agba ama banyere onwe m. Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.”
JOH 8:19 Mgbe ahụ ha jụrụ ya, “Olee ebe Nna gị nọ?” Jisọs zara, “Unu amaghị m, unu amakwaghị Nna m. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.”
JOH 8:20 Okwu ndị a niile ka o kwuru nʼụlọnsọ ukwu ha, mgbe ọ na-akụzi ihe na mpaghara ụlọ ahụ ebe a na-adọba onyinye. Ma ọ dịghị onye ọbụla jidere ya nʼihi na oge ya erubeghị.
JOH 8:21 Ọzọ ọ gwara ha, “Aga m ahapụ unu, unu ga-achọ m, ma unu ga-anwụ nʼime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nʼebe m na-aga.”
JOH 8:22 Nke a mere ka ndị Juu na-asị, “Ọ ga-egbu onwe ya? Ọ bụ ya mere o ji sị, ‘Ebe m na-aga unu apụghị ị bịa’?”
JOH 8:23 Ma ọ sịrị ha, “Unu si nʼala ma esi m nʼelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa a.
JOH 8:24 A sịrị m unu na unu ga-anwụ nʼime mmehie unu, naanị na unu kwenyere na mụ onwe m, bụ onye ahụ.”
JOH 8:25 Ha jụrụ ya, “Onye ka ị bụ?” Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ.
JOH 8:26 E nwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu nʼikpe unu ikpe. Ma matanụ na onye ahụ zitere m bụ onye eziokwu. Nʼihi nke a, ihe niile m nụrụ site nʼọnụ ya ka m gwara ụwa.”
JOH 8:27 Ọ bụ ihe banyere Nna ya ka ọ na-agwa ha, ma ha aghọtaghị ya.
JOH 8:28 Ya mere Jisọs sịrị, “Mgbe unu weliri Nwa nke Mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-ama na mụ onwe m bụ ya. Unu ga-amatakwa na ọ dịghị ihe m na-eme nʼonwe m, kama, dị ka Nna m ziri m ka m na-ekwu ihe ndị a.
JOH 8:29 Onye ahụ nke zitere m na-anọnyekwara m. Ọ hapụghịkwa m mgbe ọbụla, nʼihi na ọ bụ ihe na-amasị ya ka m na-eme mgbe niile.”
JOH 8:30 Mgbe ọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na ya.
JOH 8:31 Jisọs gwara ndị Juu ndị kwere na ya, “Ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwu m nʼezie unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m.
JOH 8:32 Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”
JOH 8:33 Ha zara ya, “Anyị bụ ụmụ Ebraham, o nwebeghị oge anyị ji bụrụ ohu onye ọbụla. Olee otu i si na-asị na a ga-eme ka anyị nwere onwe anyị?”
JOH 8:34 Jisọs zara ha, “Nʼezie, nʼezie asị m unu, onye ọbụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie.
JOH 8:35 Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi.
JOH 8:36 Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu nʼezie, unu ga-abụ ndị nwere onwe unu.
JOH 8:37 Ama m na unu bụ ụmụ ụmụ Ebraham, ma unu na-achọ igbu m nʼihi na okwu m enweghị ọnọdụ nʼime unu.
JOH 8:38 Ana m ekwu ihe m hụrụ nʼebe Nna m nọ, ma unu na-eme ihe unu nụrụ site nʼaka nna unu.”
JOH 8:39 Ha zara ya, “Ebraham bụ nna anyị.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebraham, unu gara na-arụ ọrụ Ebraham rụrụ.
JOH 8:40 Ma unu na-achọ igbu m, bụ onye gwara unu eziokwu ahụ m nụrụ nʼebe Chineke nọ. Ebraham emeghị otu a.
JOH 8:41 Unu na-arụ ọrụ nna unu rụrụ.” Ha sịrị ya, “Anyị abụghị ụmụ a mụrụ site nʼịkwa iko; naanị Chineke ya onwe ya bụ otu Nna anyị nwere.”
JOH 8:42 Jisọs gwara ha, “Ọ bụrụ nʼezie na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m nʼanya, nʼihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nʼike aka m.
JOH 8:43 Gịnị mere unu adịghị aghọta ihe m na-ekwu? Ọ bụ na unu enweghị ike ịnabata okwu m.
JOH 8:44 Unu bụ ụmụ nke nna unu ekwensu. Uche unu bụ imezu ihe nke nna unu na-achọ. Ọ bụ ogbu ọchụ site na mbụ. Ọ dịghị ejigide eziokwu nʼihi na eziokwu adịghị nʼime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọdịdị ya sịrị dị, nʼihi na ọ bụ onye ụgha bụrụkwa nna nke ụgha.
JOH 8:45 Ma nʼihi na m na-ekwu eziokwu, ọ bụ ya mere unu ekwenyeghị na m.
JOH 8:46 O nwere onye nʼime unu pụrụ ịtụ m mmehie m nʼihu? Ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, gịnị mere unu ekwenyeghị na m?
JOH 8:47 Onye ọbụla sitere na Chineke na-anụ ihe Chineke na-ekwu. Ihe kpatara unu adịghị anụ bụ maka unu abụghị ndị nke Chineke.”
JOH 8:48 Ndị Juu zara sị, “Anyị e kwughị eziokwu mgbe anyị sịrị na ị bụ onye Sameria, na mmụọ ọjọọ bikwa nʼime gị?”
JOH 8:49 Jisọs zaghachiri, “Mmụọ ọjọọ ọbụla adịghị nʼime m, kama ana m asọpụrụ Nna m, ma unu adịghị asọpụrụ m.
JOH 8:50 Anaghị m achọ otuto nke onwe m, kama ọ dị onye nke na-achọ ya. Ọ bụkwa ya bụ onye ikpe.
JOH 8:51 Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.”
JOH 8:52 Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi.
JOH 8:53 Ị dị ukwuu karịa nna anyị Ebraham? Ọ nwụrụ, ma ndị amụma nwụkwara. Onye ka ị na-eche na ị bụ?”
JOH 8:54 Jisọs zara, “Ọ bụrụ na m etoo onwe m, otuto m bụ ihe efu, Nna m, onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu, bụ onye na-eto m.
JOH 8:55 Amaara m onye ọ bụ nʼagbanyeghị na unu amaghị ya. Aga m abụ onye ụgha ma ọ bụrụ na m ga-asị na-amaghị m onye ọ bụ. Amaara m ya na-edebekwa okwu ya.
JOH 8:56 Nna unu Ebraham ṅụrịrị ọṅụ mgbe o chetara na ọ ga-ahụ ụbọchị m; ọ hụrụ ya ma ṅụrịakwa ọnụ.”
JOH 8:57 Ndị Juu sịrị ya, “Ị gbabeghị iri afọ ise ma ị hụla Ebraham?”
JOH 8:58 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, tupu amụọ Ebraham, mụ onwe m nọ ya.”
JOH 8:59 Ya mere, ha tụtụlitere nkume ịtụ ya, ma Jisọs zoro onwe ya, sitekwa nʼụlọnsọ ukwuu ahụ pụọ.
JOH 9:1 Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site nʼafọ nne ya.
JOH 9:2 Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Onye ozizi, onye mehiere? Nwoke a ka ọ bụ ndị mụrụ ya, nke mere e ji mụọ ya nʼìsí?”
JOH 9:3 Jisọs sịrị, “Nwoke a emehieghị, ndị mụrụ ya emehiekwaghị, kama o kpuru ìsì ka ọrụ Chineke pụta ìhè na ndụ ya.
JOH 9:4 Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye ahụ zitere m, mgbe chi ka dị, anyasị na-abịa mgbe o nweghị onye pụrụ ịrụ ọrụ.
JOH 9:5 Dị ka m nọ nʼụwa, Abụ m ìhè nke ụwa.”
JOH 9:6 Mgbe o kwusiri nke a, ọ bụsara ọnụ mmiri asụ nʼala gwakọta ya na aja, werekwa aja ahụ tee nwoke ahụ nʼanya.
JOH 9:7 Ọ gwara ya, “Gaa nʼọdọ mmiri Sailọm saa ihu gị” (nke a pụtara “Zitere”). Ọ gara saa ihu ya, lọghachita na-ahụ ụzọ.
JOH 9:8 Ndị agbataobi ya na ndị nʼahụ ya nʼoge gara aga ka ọ na-arịọ arịrịọ sịrị, “Nke a, ọ bụghị nwoke ahụ na-anọdụ ala na-arịọ arịrịọ?”
JOH 9:9 Ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ya.” Ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụghị ya. Ọ bụ onye yiri ya.” Ma ọ na-asị, “Abụ m nwoke ahụ.”
JOH 9:10 Ha na-asị ya, “Olee otu anya gị sịrị meghee?”
JOH 9:11 Ọ zara, “Nwoke a na-akpọ Jisọs gwakọtara ụrọ tee m nʼanya. Ọ gwara m sị, ‘Gaa saa ihu gị nʼọdọ mmiri Sailọm.’ A gara m saa onwe m, malitekwa ịhụ ụzọ.”
JOH 9:12 Ha sịrị ya, “Olee ebe nwoke ahụ nọ?” Ọ sịrị, “Amaghị m.”
JOH 9:13 Ha dutere nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ nʼihu ndị Farisii.
JOH 9:14 Ma ọ bụ nʼụbọchị izuike ka Jisọs gwakọtara aja, jiri ya meghe anya ya.
JOH 9:15 Ya mere, ndị Farisii jụrụ ya otu o si bido ịhụ ụzọ. Ọ sịrị ha, “Ọ gwakọtara aja tee m nʼanya, a sakwara m ihu ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
JOH 9:16 Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ bịa, nʼihi na ọ dịghị edebe ụbọchị izuike.” Ma ndị ọzọ na-asị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ ịrịbama ndị dị otu a?” Nkewa dịrị nʼetiti ha.
JOH 9:17 Ya mere, ha sịrị nwoke ahụ kpuru ìsì, “Gịnị ka i nwere ikwu banyere ya? Ọ bụ anya gị ka o meghere.” Ọ sịrị, “Ọ bụ onye amụma.”
JOH 9:18 Ma ndị Juu ahụ ekweghị na nwoke a bụ onye kpuru ìsì na mbụ, nke e mere ka ọ hụ ụzọ, tutu ruo mgbe ha kpọrọ ndị mụrụ ya.
JOH 9:19 Ha jụrụ ha sị, “Onye a ọ bụ nwa unu, onye unu na-asị na o kpuru ìsì site nʼoge a mụrụ ya? O si aṅaa ahụ ụzọ ugbu a?”
JOH 9:20 Ndị mụrụ ya zara, “nke a bụ nwa anyị. Anyị matakwara na o kpuru ìsì site nʼoge anyị mụrụ ya.
JOH 9:21 Ma otu o si ahụ ụzọ ugbu a maọbụ onye meghere anya ya, anyị amaghị. Jụọnụ ya. Ọ bụ dimkpa, ya zara ọnụ ya.”
JOH 9:22 Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nʼihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị kpebirila na ọ bụrụ na onye ọbụla ekwuo na Jisọs bụ Kraịst ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nʼụlọ ekpere ha.
JOH 9:23 Nke a mere ndị mụrụ ya jiri sị, “Ọ bụ dimkpa, unu jụọ ya.”
JOH 9:24 Ha kpọrọ nwoke a nke ugboro abụọ, bụ onye ahụ kpuburu ìsì, sị ya, “Nye Chineke otuto. Anyị maara na nwoke a bụ onye mmehie.”
JOH 9:25 Ọ zara, “Amaghị m maọbụ onye mmehie ma ọ bụghị. Ma otu ihe ka m maara, ekpuru m ìsì na mbụ ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
JOH 9:26 Ha sịrị ya, “Gịnị ka o mere gị? Olee otu o si meghe anya gị?”
JOH 9:27 Ọ zara ha, “Agwala m unu ihe niile, ma unu achọghị ikwere. Gịnị mere unu ji chọọ ịnụ ya ọzọ? Unu chọkwara ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?”
JOH 9:28 Ha bigbọrọ ya sị, “Gị onwe gị bụrụkwa onye na-eso ụzọ ya! Anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosis.
JOH 9:29 Anyị mara na Chineke gwara Mosis okwu, ma gbasara nwoke a, anyị amaghị ebe o siri bịa.”
JOH 9:30 Nwoke ahụ zaghachiri sị ha, “Ma otu ọ dị, nke a bụ ihe ịtụnanya! Unu amaghị ebe o sịrị bịa ma o meghere anya m.
JOH 9:31 Anyị mara na Chineke adịghị ege ndị mmehie ntị, ma ọ na-ege ntị onye na-atụ egwu ya na onye na-eme uche ya.
JOH 9:32 Site na mgbe e kere ụwa, ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì.
JOH 9:33 Ọ bụrụ na nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ, ọ gaghị enwe ike ime ihe ọbụla.”
JOH 9:34 Ha zara sị ya, “Gị onye a mụrụ nʼime mmehie, ị na-achọ ikuziri anyị ihe?” Ha chụpụrụ ya nʼezi.
JOH 9:35 Jisọs nụrụ na ha achụpụla ya nʼezi, ma mgbe ọ chọtara ya, ọ sịrị ya, “I kweere na Nwa nke Mmadụ?”
JOH 9:36 Ọ zara sị, “Onyenwe m, ọ bụ onye? Gwa m ka m nwe ike ikwere na ya.”
JOH 9:37 Jisọs sịrị ya, “Ị hụla ya ugbu a; onye gị na ya na-ekwurịta okwu bụ onye ahụ.”
JOH 9:38 Ọ sịrị, “Onyenwe m, ekwela m.” Ọ kpọrọ isiala nye ya.
JOH 9:39 Jisọs sịrị, “Ọ bụ nʼihi ikpe ka m ji bịa nʼụwa, ka ndị na-adịghị ahụ ụzọ bido ịhụ ụzọ, na ka ndị na-ahụ ụzọ ghọọ ndị kpuru ìsì.”
JOH 9:40 Mgbe ụfọdụ ndị Farisii nọ nso nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị ya, “Anyị onwe anyị, anyị bụkwa ndị kpuru ìsì?”
JOH 9:41 Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, ikpe ọmụma mmehie agaghị ama unu, ma ugbu a ebe unu sị na unu na-ahụ ụzọ ikpe ọmụma unu na-adịgide.”
JOH 10:1 “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-adịghị esite nʼọnụ ụzọ aba nʼọgba atụrụ kama ọ na-arị elu ka o site nʼelu ụlọ ahụ wufee, bụ onye ohi bụrụkwa onye na-apụnara mmadụ ihe.
JOH 10:2 Onye na-esite nʼọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ.
JOH 10:3 Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ.
JOH 10:4 Mgbe ọ kpọpụtasịrị ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga nʼihu ha. Atụrụ ya na-esokwa ya nʼazụ nʼihi na ha maara olu ya.
JOH 10:5 Ha agaghị eso onye ọbịa, kama ha gbaara ya ọsọ. Nʼihi na ha amaghị olu onye ọbịa.”
JOH 10:6 Jisọs ji ihe yiri ihe gwa ha okwu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-agwa ha.
JOH 10:7 Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ.
JOH 10:8 Ndị niile bịara tupu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị.
JOH 10:9 Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri.
JOH 10:10 Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke.
JOH 10:11 “Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya.
JOH 10:12 Onye e goro ọrụ, nke na-abụghị onye nche atụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, ọ na-ahapụ ha gbaa ọsọ mgbe ọ hụrụ agụ ka ọ na-abịa; mgbe ahụ agụ na-achụso atụrụ ahụ chụsasịa ha.
JOH 10:13 Onye e goro ọrụ na-agbapụ, nʼihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ọ naghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ndị ahụ.
JOH 10:14 “Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; amaara m atụrụ m, atụrụ nke m makwaara m.
JOH 10:15 Dị ka Nna ahụ maara m, mụ onwe m makwa Nna ahụ. Ana m atọgbọ ndụ m nʼihi atụrụ ahụ.
JOH 10:16 Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nʼọgba atụrụ a. Aghaghị m ịkpọbatakwa ha. Ha onwe ha ga-anụ olu m, a ga-enwekwa otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ.
JOH 10:17 Maka nke a ka Nna jiri hụ m nʼanya, nʼihi na ana m atọgbọ ndụ m, ka m wereghachikwa ya ọzọ.
JOH 10:18 O nweghị onye ọbụla pụrụ ịnara m ya, kama ana m atọgbọ ya nʼike nke onwe m. Enwere m ikike ịtọgbọ ya, nweekwa ikike iwereghachi ya ọzọ. Anatara m iwu a site nʼaka Nna m.”
JOH 10:19 Ọzọkwa, nkewa batara nʼetiti ndị Juu nʼihi okwu ndị a.
JOH 10:20 Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu, “Ọ bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị ya, onye isi mebiri. Ọ bara uru ige ya ntị?”
JOH 10:21 Ma ndị ọzọ na-ekwu, “Okwu ndị a adịghị ka nke onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Mmụọ ọjọọ o nwere ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee?”
JOH 10:22 Nʼoge ahụ, mmemme icheta mgbe e doro ụlọnsọ ukwu ahụ nsọ ruru na Jerusalem. Ọ bụ oge oke oyi,
JOH 10:23 ma Jisọs nọ na-ejegharị nʼụlọnsọ ukwu, nʼịba Solomọn.
JOH 10:24 Ndị Juu gbara ya gburugburu sị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-edebe anyị nʼọnọdụ olileanya? Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst ahụ, gwaghee anyị ọnụ.”
JOH 10:25 Jisọs zara ha, “Agwara m unu, ma unu ekweghị. Ọrụ m na-arụ nʼaha Nna m na-agba ama banyere m.
JOH 10:26 Ma unu ekwenyeghị, nʼihi na unu esoghị nʼigwe atụrụ m.
JOH 10:27 Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m.
JOH 10:28 Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m.
JOH 10:29 Nna m onye nyere m ha dị ukwuu karịa ihe niile. O nweghị onye nwere ike ịnapụ ha site nʼaka Nna m.
JOH 10:30 Mụ na nna m bụ otu.”
JOH 10:31 Ndị Juu tụtụlitekwara nkume ọzọ ịtụ ya.
JOH 10:32 Ma Jisọs zara ha, “E zila m unu ọtụtụ ọrụ ọma nke sitere nʼaka Nna m, olee nke unu na-achọ ịtụ m nkume nʼihi ya?”
JOH 10:33 Ndị Juu zara ya, “Anyị achọghị ịtụ gị nkume nʼihi ọrụ ọma ndị a, kama nʼihi nkwulu na nʼihi na gị bụ mmadụ efu, ma ị na-eme onwe gị Chineke.”
JOH 10:34 Jisọs zara ha, “Edeghị ya nʼiwu unu, sị, ‘Mụ onwe m sịrị na unu bụ chi’?
JOH 10:35 Ọ bụrụ na a kpọrọ ndị ahụ nabatara okwu Chineke ‘chi,’ apụghịkwa imebi ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.
JOH 10:36 Unu na-ekwu na onye ahụ Chineke doro nsọ ma zitekwa ya nʼime ụwa na-ekwulu Chineke nʼihi na m sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke?’
JOH 10:37 Unu ekwenyela na m, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọrụ Nna m ka m na-arụ.
JOH 10:38 Ma ọ bụrụ na m na-arụ ya, a sịkwarị na unu ekweghị na m, kwerenụ nʼọrụ ndị a, ka unu nwee ike mata ma ghọtakwa na Nna ahụ nọ nʼime m, mụ onwe m nọkwa nʼime Nna ahụ.”
JOH 10:39 Ọzọkwa, ha gbalịrị ijide ya ma ọ siri nʼaka ha pụọ.
JOH 10:40 Mgbe ahụ ọ laghachiri azụ nʼofe osimiri Jọdan, bụ ebe Jọn nọrọ na mbụ mee baptizim, ebe ahụ ka ọ nọdụrụ.
JOH 10:41 Ọtụtụ ndị mmadụ bịakwutere ya. Ha na-asị, “Jọn arụghị ọrụ ihe ịrịbama ọbụla, ma ihe niile Jọn kwuru banyere nwoke a bụ eziokwu.”
JOH 10:42 Ọtụtụ mmadụ kwenyekwara na ya nʼebe ahụ.
JOH 11:1 Nʼoge ahụ, ahụ adịghị otu nwoke a na-akpọ Lazarọs onye Betani, nke bụ obodo nta nke Meri na Mata nwanne ya nwanyị.
JOH 11:2 Nke a bụ Meri ahụ weere mmanụ otite dị oke ọnụahịa tee Onyenwe anyị, ma jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Ọ bụ nwanne ya nwoke Lazarọs bụ onye nọ nʼọrịa.
JOH 11:3 Nke a mere ụmụnne ya nwanyị zigara Jisọs ozi sị, “Onyenwe anyị, onye ahụ nke ị hụrụ nʼanya nọ nʼọrịa.”
JOH 11:4 Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ sịrị, “Ọrịa a abụghị nke ọnwụ kama ọ bụ iji nye Chineke otuto nakwa ka e site na ya nye Ọkpara Chineke otuto.”
JOH 11:5 Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị na Lazarọs nʼanya.
JOH 11:6 Mgbe ọ nụrụ na Lazarọs nọ nʼọrịa, ọ nọkwuru mkpụrụ ụbọchị abụọ nʼebe ahụ ọ nọ.
JOH 11:7 Ya mere, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ngwanụ ka anyị laghachi azụ na Judịa.”
JOH 11:8 Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onye ozizi, nʼoge nta gara aga ka ndị Juu chọrọ ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?”
JOH 11:9 Jisọs zara, “Ọ bụghị awa iri na abụọ dị nʼotu ehihie nke ụbọchị? Onye na-ejegharị nʼehihie anaghị asụ ngọngọ, nʼihi na ọ na-eji ìhè nke ụwa a ahụ ụzọ.
JOH 11:10 Ma ndị na-ejegharị nʼabalị na-azọhie ụkwụ, nʼihi na ìhè adịghị nʼime ha.”
JOH 11:11 Mgbe o kwusiri nke a, ọ gwakwara ha, “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ana m aga ịkpọte ya nʼụra.”
JOH 11:12 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ọ ga-adị mma.”
JOH 11:13 Ihe Jisọs na-ekwu bụ banyere ọnwụ ya ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ịrahụ ụra efu.
JOH 11:14 Mgbe ahụ, Jisọs gwaghere ha ọnụ, “Lazarọs anwụọla.
JOH 11:15 Ma nʼihi unu, obi dị m ụtọ na anọghị m nʼebe ahụ, ka unu nwe ike kwere. Ma bịanụ ka anyị gakwuru ya.”
JOH 11:16 Tọmọs, onye a na-akpọ Didimọs, gwara ndị na-eso ụzọ ibe ya, “Ka anyị gakwanụ ka anyị soro ya nwụọ.”
JOH 11:17 Mgbe Jisọs rutere, ọ chọpụtara na Lazarọs anọọlarị nʼili ụbọchị anọ.
JOH 11:18 Betani dị Jerusalem nso, ihe dị ka kilomita atọ.
JOH 11:19 Ma ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Mata na Meri ịkasị ha obi nʼihi ọnwụ nwanne ha nwoke.
JOH 11:20 Mgbe ozi ọbịbịa Jisọs ruru Mata ntị, ọ gara izute ya, ma Meri nọdụrụ nʼụlọ.
JOH 11:21 Mata sịrị Jisọs, “Onyenwe m, a sị na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.
JOH 11:22 Ma ugbu a, amara m na Chineke ga-enye gị ihe ọbụla ị rịọrọ.”
JOH 11:23 Jisọs sịrị ya, “Nwanne gị nwoke ga-ebili ọzọ.”
JOH 11:24 Mata sịrị ya, “Amara m na ọ ga-ebili ọzọ nʼụbọchị mbilite nʼọnwụ nʼoge ikpeazụ.”
JOH 11:25 Jisọs gwara ya, “Mụ onwe m bụ mbilite nʼọnwụ na ndụ. Onye ọbụla kwere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.
JOH 11:26 Ma onye ọbụla dị ndụ nke na-ekwere na m agaghị anwụ. Ị kwere nke a?”
JOH 11:27 Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe m, ekwere m na ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke, onye ga-abịa nʼụwa.”
JOH 11:28 Mgbe o kwuchara nke a, ọ gara kpọọ nwanne ya nwanyị bụ Meri, jiri nwayọọ sị ya, “Onye ozizi abịala, ọ na-akpọ gị.”
JOH 11:29 Mgbe ọ nụrụ nke a, ọ biliri ọsịịsọ ga zute ya.
JOH 11:30 Ruo mgbe a, Jisọs abịarutebeghị nʼobodo nta ahụ, ma ọ ka nọ nʼebe ahụ Mata zutere ya.
JOH 11:31 Ndị Juu nọ nʼụlọ na-akasị Meri obi hụrụ ya ka ọ pụrụ ngwangwa. Ha sochiri ya nʼazụ nʼihi na ha chere na ọ na-aga nʼili ibe akwa nʼebe ahụ.
JOH 11:32 Mgbe Meri rutere nʼebe Jisọs nọ, ọ dara nʼụkwụ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.”
JOH 11:33 Mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-ebe akwa ya na ndị Juu ahụ so ya ka ha na-ebekwa akwa, o metụrụ ya nʼime mmụọ ya. O nwere ọmịiko dị ukwuu.
JOH 11:34 Ọ sịrị, “Olee ebe unu liri ya?” Ha sịrị ya, “Onyenwe anyị bịa ka ị hụ.”
JOH 11:35 Jisọs ebee akwa.
JOH 11:36 Mgbe ahụ ndị Juu na-asị, “Lee ka o si hụ ya nʼanya.”
JOH 11:37 Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nwoke a meghere anya onye kpuru ìsì, ọ garaghị enwe ike mee ka nwoke a hapụ ịnwụ?”
JOH 11:38 Ọzọkwa, Jisọs sụrụ ude nʼime onwe ya nke ukwuu, bịarute nʼili ahụ nso. Ili ahụ bụ ọgba e jiri nkume dị ukwuu mechie ọnụ ya.
JOH 11:39 Jisọs sịrị, “Bupunụ nkume ahụ!” Ma Mata, nwanne nwanyị onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ ga na-esi isi ugbu a, nʼihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.”
JOH 11:40 Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ na m agwaghị gị sị na ọ bụrụ na ị kwere ị ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?”
JOH 11:41 Ya mere, ha bupụrụ nkume ahụ. Jisọs lere anya nʼelu sị, “Nna, ana m ekele gị nʼihi na ị nụla olu m.
JOH 11:42 Amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile. Ana m ekwu nke a nʼihi ndị a gbara m gburugburu nʼebe a, ka ha kwere na ọ bụ gị zitere m.”
JOH 11:43 Mgbe o kwusiri nke a, o jiri oke olu tie mkpu, “Lazarọs, pụta!”
JOH 11:44 Onye ahụ nwụrụ anwụ pụtara, e jikwa akwa ozu kekọta aka ya na ụkwụ ya, werekwa akwa ịchafu kechie ihu ya. Jisọs sịrị ha, “Tọpụnụ ya, hapụ ya ka ọ laa.”
JOH 11:45 Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Meri bụ ndị hụrụ ihe a o mere, kwere na ya.
JOH 11:46 Ma ụfọdụ nʼime ha lara gaa kọọrọ ndị Farisii ihe o mere.
JOH 11:47 Mgbe ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin. Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Nʼihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịbama.
JOH 11:48 Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya ka ọ gaa nʼihu, mmadụ niile ga-ekwere na ya. Ndị Rom ga-abịakwa, kwatuo ụlọnsọ ukwu ma napụ anyị obodo anyị.”
JOH 11:49 Ma otu onye nʼime ha bụ Kaịfas, onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ sịrị ha, “Unu amaghị ihe ọbụla.
JOH 11:50 Ọ bụ na unu amaghị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile, karịa nʼobodo anyị niile ga-ala nʼiyi.”
JOH 11:51 Dị ka onyeisi nchụaja nke afọ ahụ, o kwughị nke a site nʼechiche ya, kama o buru amụma na Jisọs ga-anwụ nʼihi mba ndị Juu.
JOH 11:52 Ọ bụghị nʼihi mba ahụ naanị, kama, ka ọ kpọkọta ụmụ Chineke ndị gbasara nʼebe niile.
JOH 11:53 Ya mere, site nʼụbọchị ahụ, ha malitere ịgba izu otu ha ga-esi gbuo ya.
JOH 11:54 Ya mere, Jisọs kwụsịrị ịgagharị ebe ndị Juu ga-ahụ ya. O siri nʼebe ahụ pụọ gaa nʼakụkụ ọzara nʼotu obodo nta a na-akpọ Ifrem. Ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụrụ nʼebe ahụ.
JOH 11:55 Mmemme Ngabiga ndị Juu dịkwa nso. Ọtụtụ ndị mmadụ si nʼakụkụ ala ndị Juu niile bịa Jerusalem. Ha bịara tutu mmemme ahụ ebido ka ha mee onwe ha ka ha dị ọcha.
JOH 11:56 Ha na-achọ Jisọs na-ajụrịta onwe ha nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, “Gịnị ka unu chere? Ọ bụ na ọ gaghị abịa na mmemme a?”
JOH 11:57 Ma nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii enyela iwu ka onye ọbụla hụrụ ya bịa gwa ha ka ha gaa jide ya.
JOH 12:1 Ụbọchị isii tupu e mee Mmemme Ngabiga, Jisọs gara Betani bụ obodo Lazarọs, onye ahụ ọ mere ka o site nʼọnwụ bilie.
JOH 12:2 Nʼebe ahụ, ha siiri Jisọs nri, ọ bụkwa Mata na-eje ozi isi nri ahụ, Lazarọs bụ otu onye nʼime ndị sooro ya nọdụ na nri ahụ.
JOH 12:3 Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ otite dị ọkara lita nke ezigbo naad, mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụahịa, ọ wụkwasara ya Jisọs nʼụkwụ, jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nʼisi ụtọ nke mmanụ otite ahụ.
JOH 12:4 Ma Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya, onye ahụ ga-arara ya nye, kwuru,
JOH 12:5 “Gịnị mere na-ereghị mmanụ otite a narị denarị atọ, were ego ya nye ndị ogbenye?”
JOH 12:6 O kwughị nke a nʼihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nʼobi kama nʼihi na ọ bụ onye ohi; dị ka onye na-ejide akpa ego ha, mgbe ụfọdụ, ọ na-amanye aka nʼego ahụ zubiri ego.
JOH 12:7 Jisọs sịrị, “Hapụ ya aka, ọ zụtara ya ka ọ na-akwado maka ụbọchị olili m.
JOH 12:8 Unu nwere ndị ogbenye nʼetiti unu mgbe niile, ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.”
JOH 12:9 Ma mgbe igwe ndị Juu nụrụ na ọ nọ nʼebe ahụ, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs onye o mere ka o si na ndị nwuru anwụ bilie.
JOH 12:10 Ya mere, ndịisi nchụaja gbakwara izu igbukwa Lazarọs.
JOH 12:11 Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs.
JOH 12:12 Nʼechi ya oke igwe mmadụ ahụ ndị bịara mmemme nụrụ na Jisọs na-abịa Jerusalem.
JOH 12:13 Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Ngọzị dịrị eze Izrel!”
JOH 12:14 Jisọs hụrụ nwa ịnyịnya ibu, nọkwasị nʼelu ya, dị ka e dere ya,
JOH 12:15 “Atụla egwu, gị ada Zayọn! Lee, eze gị ka ọ na-abịa. Ọ nọkwasịrị nʼelu nwa ịnyịnya ibu.”
JOH 12:16 Na mbụ ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a niile. Ma mgbe e nyesịrị Jisọs otuto, ka ha chetara na-edererị ihe ndị a banyere ya, na e mekwara ya rịị ihe ndị a.
JOH 12:17 Igwe mmadụ ahụ bụ ndị ya na ha nọ mgbe o si nʼili kpọpụta Lazarọs, mee ka o sị nʼọnwụ bilie, gara nʼihu na-agba ama ya.
JOH 12:18 Ọtụtụ mmadụ pụrụ izute ya nʼihi na ha nụrụ akụkọ ọrụ ihe ịrịbama niile ọ rụrụ.
JOH 12:19 Ya mere, ndị Farisii sịrịtara onwe ha, “Unu ahụla na o nweghị ihe unu pụrụ ime, leenụ ka ụwa niile na-eso ya.”
JOH 12:20 Ma ụfọdụ ndị Griik so nʼime ndị ahụ bịara ife ofufe nʼoge mmemme ahụ.
JOH 12:21 Ha bịakwutere Filip onye si Betsaida dị na Galili, gwa ya sị, “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.”
JOH 12:22 Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs.
JOH 12:23 Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto.
JOH 12:24 Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ.
JOH 12:25 Ndị ọbụla hụrụ ndụ ha nʼanya ga-atụfu ya, ebe ndị ọbụla kpọrọ ndụ ha asị nʼụwa a, ga-edebe ya ruo mgbe ebighị ebi.
JOH 12:26 Onye ọbụla na-ejere m ozi aghaghị iso m; ebe m nọ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa. Onye ọbụla na-ejere m ozi ka Nna m ga-asọpụrụ.
JOH 12:27 “Ugbu a, mkpụrụobi m jupụtara nʼihe mgbu. Gịnịkwa ka m ga-ekwu, Nna, zọpụta m nʼawa nke a? Mba! Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa nʼoge awa a.
JOH 12:28 Nna, nye aha gị otuto.” Mgbe ahụ, otu olu siri nʼeluigwe bịa, “Enyela m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.”
JOH 12:29 Igwe ndị mmadụ guzo nʼebe ahụ, ndị nụrụ ya na-ekwu, “Ọ bụ egbe eluigwe gbara.” Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.”
JOH 12:30 Jisọs zara ma sị, “Olu a abịaghị nʼihi m kama ọ bịara nʼihi unu.
JOH 12:31 Ugbu a bụ oge a ga-ekpe ụwa a ikpe. Ugbu a ka a ga-achụpụ onye ahụ na-achị ụwa a.
JOH 12:32 Ma mụ onwe m, mgbe e si nʼụwa welie m elu, aga m adọta mmadụ niile nye onwe m.”
JOH 12:33 O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ nke ọ gaje ịnwụ.
JOH 12:34 Igwe mmadụ ahụ zara ya, “Anyị anụla site nʼakwụkwọ iwu na Kraịst ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma gịnị mere i ji asị na, ‘A ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu’? Onye bụ ‘Nwa nke mmadụ a’?”
JOH 12:35 Jisọs sịrị ha, “Ìhè ga-enwuru unu naanị nwa oge nta. Jegharịanụ nʼìhè a, ugbu a unu nwere ya, tupu ọchịchịrị abịakwasị unu. Onye na-ejegharị nʼọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga.
JOH 12:36 Kwerenụ nʼìhè ahụ ugbu a unu nwere ya ka unu ghọọ ụmụ nke ìhè.” Mgbe Jisọs kwusiri nke a ọ hapụrụ ha pụọ ga zoo onwe ya.
JOH 12:37 Nʼagbanyeghị ọrụ ịrịbama niile ọ rụrụ nʼetiti ha, ha ekwereghị na ya.
JOH 12:38 Nke a bụ imezu ihe Aịzaya onye amụma kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?”
JOH 12:39 Ma ha enweghị ike kwere, nʼihi na Aịzaya kwukwara nʼebe ọzọ, sị,
JOH 12:40 “O meela ka ha kpuo ìsì, mekwa ka obi ha kpọchie Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ maọbụ jiri obi ha ghọta ihe ọbụla Ka ha gharakwa ichigharị, ka m gwọọ ha.”
JOH 12:41 Aịzaya kwuru ihe ndị a nʼihi na ọ hụrụ ebube ya, ma kwuo banyere ya.
JOH 12:42 Otu ọ dị, ọtụtụ nʼime ndịisi kweere na ya, ma ha ekwupụtaghị nke a. Nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị Farisii ga-achụpụ ha site nʼụlọ ekpere.
JOH 12:43 Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke.
JOH 12:44 Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m.
JOH 12:45 Nʼihi na onye ọbụla hụrụ m ahụla onye nke zitere m.
JOH 12:46 Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị.
JOH 12:47 “Ma ọ bụrụ na onye ọbụla anụ okwu m ma ju ime ya, ọ bụghị m na-ekpe ya ikpe. Nʼihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.
JOH 12:48 Onye ọbụla jụrụ m ma jụkwa okwu m, nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Okwu niile m kwuru ga-ama ya ikpe nʼụbọchị ikpeazụ.
JOH 12:49 Okwu ndị a esiteghị nʼaka m. Ha sitere nʼaka Nna ahụ onye zitere m ma nyekwa m iwu ihe m ga-ekwu na otu m ga esi kwuo ya.
JOH 12:50 Ama m na iwu ya bụ ndụ ebighị ebi, nʼihi ya, ihe ọbụla Nna gwara m ka m na-ekwu.”
JOH 13:1 Tupu oge Mmemme Ngabiga eruo, Jisọs amatala na oge ọ ga-ahapụ ụwa lakwuru Nna ya eruola. Ọ hụrụ ndị nke ya nọ nʼụwa nʼanya, hụkwa ha nʼanya ruo ọgwụgwụ.
JOH 13:2 Mgbe a na-eri nri anyasị, ekwensu etinyelarị ya nʼime obi Judas Iskarịọt, nwa Saimọn ka ọ rara ya nye.
JOH 13:3 Jisọs matara na Nna enyefeela ya ihe niile nʼaka. Ọ maara na ya si nʼebe Chineke nọ bịa, matakwa na ya ga-alaghachikwuru Chineke.
JOH 13:4 Ya mere, o sitere nʼoche ọ nọkwasịrị bilie ọtọ, yipụ uwe nke elu ya, chiri akwa mmiri e ji ehicha ahụ kee nʼukwu ya.
JOH 13:5 Ọ wụnyere mmiri nʼime efere ịsa aka, bido ịsa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ, jirikwa akwa mmiri ahụ o kere nʼukwu ya na-ehicha ụkwụ ha.
JOH 13:6 Ọ bịakwutere Saimọn Pita, onye sịrị ya, “Onyenwe m, ị ga-asa m ụkwụ?”
JOH 13:7 Ma Jisọs zara sị ya, “Ị ghọtaghị ihe m na-eme ugbu a, ma emesịa ị ga-aghọta ya.”
JOH 13:8 Pita sịrị ya, “Ị gaghị asaa m ụkwụ ma ọlị.” Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, mụ na gị enweghị oke ọbụla.”
JOH 13:9 Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe m, ọ bụghị naanị ụkwụ m ka ị ga-asa, kama saakwa aka m na isi m.”
JOH 13:10 Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla sara ahụ agaghị asakwa ya ọzọ, ọ bụ naanị ịsa ụkwụ ya dịrị ya nʼihi na ahụ ya niile dị ọcha. Unu dị ọcha, kama ọ bụghị unu niile.”
JOH 13:11 Nʼihi na ọ maararị onye ahụ ga-arara ya nye. Ya mere o ji sị, “Ọ bụghị unu niile dị ọcha.”
JOH 13:12 Mgbe ọ sachasịrị ha ụkwụ, o yiiri uwe ya, nọdụkwa ala ọzọ, ọ sịrị ha, “Unu ghọtara ihe m meere unu?
JOH 13:13 Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma nʼihi na nke a ka m bụ.
JOH 13:14 Ebe ọ bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu.
JOH 13:15 Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu.
JOH 13:16 Nʼezie, nʼezie, ohu adịghị adị ukwuu karịa nna ya ukwu, maọbụ onye e ziri ozi a karịa onye ziri ya ozi.
JOH 13:17 Ọ bụrụ na unu a mara ihe ndị a, ngọzị ga-adịrị unu ma unu mee ha.
JOH 13:18 “Anaghị m ekwu maka unu niile, amaara m ndị m họpụtara. Ma nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ‘Onye mụ na ya na-erikọ nri ebiliela megide m.’
JOH 13:19 “Ana m agwa unu ugbu a tupu ihe ndị a emee, ka unu kwere na mụ bụ ya mgbe ọ ga-emezu.
JOH 13:20 Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla nabatara onye m zitere nabatara m. Onye ọbụla nabatara m nabatakwara onye zitere m.”
JOH 13:21 Mgbe Jisọs kwusiri ihe ndị a, o nweghị udo nʼime mmụọ ya. Ọ gbara ama sị, “Nʼezie, nʼezie, a sị m unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.”
JOH 13:22 Ndị na-eso ụzọ ya lerịtara onwe ha anya na-eche nʼime obi ha onye ọ na-ekwu maka ya.
JOH 13:23 Otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya dabere ya nso.
JOH 13:24 Saimọn Pita fufeere ya isi, ka ọ, Jụọ ya onye ọ na-ekwu maka ya.
JOH 13:25 Ebe ọ dabere Jisọs nso, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, onye ka ọ bụ?”
JOH 13:26 Jisọs zara, “Ọ bụ onye ahụ m ga-enye iberibe achịcha a mgbe m sunyere ya nʼime efere nri.” Mgbe o sunyesịrị achịcha ahụ nʼime efere ahụ, o nyere ya Judas nwa Saimọn Iskarịọt.
JOH 13:27 Mgbe ọ narasịrị iberibe achịcha ahụ, ekwensu bara nʼime ya. Jisọs sịrị ya, “Ihe ọbụla ị chọrọ ime, mee ya ngwangwa.”
JOH 13:28 Ma ọ dịghị onye ọbụla so nọrọ nʼoche nri ghọtara ihe mere o ji gwa ya otu a.
JOH 13:29 Nʼihi na ụfọdụ na-eche, ebe Judas ji akpa ego ha, Jisọs na-asị ya ka ọ gaa zụta ihe ndị dị mkpa maka mmemme, maọbụ ka ọ gaa nye ndị ogbenye ihe.
JOH 13:30 Mgbe ọ natachara iberibe achịcha ahụ, ọ pụrụ na-atụfughị oge, ọchịchịrị agbaala.
JOH 13:31 Mgbe ọ pụrụ, Jisọs sịrị, “Ugbu a ka a na-enye Nwa nke Mmadụ otuto, a na-enyekwa Chineke otuto nʼime ya.
JOH 13:32 Ọ bụrụ na e nye Chineke otuto nʼime ya, Chineke ga-enyekwa Ọkpara ya otuto nʼime onwe ya, ọ ga-enyekwa ya otuto ahụ ngwangwa.
JOH 13:33 “Ụmụntakịrị m, enwere m oge ntakịrị nke mụ na unu ga-anọ. Unu ga-achọ m, ma dị ka m gwara ndị Juu ka m na-agwa unu ugbu a. Ebe m na-aga unu enweghị ike ịbịa ya.
JOH 13:34 “Ana m enye unu iwu ọhụrụ: Hụrịtanụ onwe unu nʼanya. Dị ka m hụrụ unu nʼanya, otu a ka unu ga-esi hụrịta onwe unu nʼanya.
JOH 13:35 Ọ bụrụ na unu ahụrịta onwe unu nʼanya, otu a ka mmadụ niile ga-esi mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.”
JOH 13:36 Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị ebee ka ị na-aga?” Jisọs zaghachiri ya, “Ebe m na-aga, i nweghị ike iso m gaa ya ugbu a. Ma ị ga-abịa ma emesịa.”
JOH 13:37 Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, gịnị mere na m apụghị isoro gị ugbu a? Aga m atọgbọ ndụ m nʼihi gị.”
JOH 13:38 Jisọs zaghachiri, “I jikeere ịtọgbọ ndụ gị nʼihi m? Nʼezie, nʼezie, asị m gị, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
JOH 14:1 “Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke; kwerekwanụ na m.
JOH 14:2 Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m na-aga kwadoro unu ebe obibi?
JOH 14:3 Ọ bụrụ na m agaa dozichara unu ebe obibi, aga m alọghachi bịa kpọrọ unu, ka ebe m nọ bụrụkwa ebe unu ga-anọ.
JOH 14:4 Unu maara ụzọ ebe m na-aga.”
JOH 14:5 Tọmọs sịrị ya, “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga, olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ya?”
JOH 14:6 Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.
JOH 14:7 Ọ bụrụ na unu maara onye m bụ, unu gaara amatakwa Nna m. Site ugbu a, unu amatala ya. Ma hụkwa ya.”
JOH 14:8 Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị Nna ahụ, afọ ga-ejukwa anyị.”
JOH 14:9 Jisọs sịrị ya, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọbụla hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, ‘zi anyị Nna ahụ?’
JOH 14:10 Ọ bụ na i kweghị na m nọ nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m? Okwu niile m na-agwa unu esitekwaghị nʼebe m nọ pụta, kama ọ bụ Nna bi nʼime m na-arụ ọrụ ya.
JOH 14:11 Kwere ihe m kwuru na anọ m nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m. Ma ọ bụghị otu a, kwerenụ nʼihi ọrụ ebube ndị a.
JOH 14:12 Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla kwere na m ga-arụ ọrụ ndị m rụrụ, rụọkwa ọrụ karịrị ndị a, nʼihi na m na-alakwuru Nna m.
JOH 14:13 Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya.
JOH 14:14 Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya.
JOH 14:15 “Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya unu ga-edebe iwu m niile.
JOH 14:16 Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ,onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi.
JOH 14:17 Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu.
JOH 14:18 Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu.
JOH 14:19 Mgbe na-adịghị anya, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu ga-ahụ m anya. Nʼihi na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ.
JOH 14:20 Nʼụbọchị ahụ, unu ga-amata na m nọ nʼime Nna m na unu nọ nʼime m, na mụ onwe m nọkwa nʼime unu.
JOH 14:21 Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m.”
JOH 14:22 Judas (ọ bụghị Iskarịọt) sịrị ya, “Onyenwe anyị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?”
JOH 14:23 Jisọs zara sị ya, “Onye ọbụla hụrụ m nʼanya, ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nʼanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nʼebe onye ahụ nọ soro ya biri.
JOH 14:24 Onye na-ahụghị m nʼanya agaghị edebe okwu m. Okwu ndị a niile unu nụrụ abụghị nke m. Ha bụ nke Nna ahụ, onye zitere m.
JOH 14:25 “Agwala m unu ihe ndị a niile ugbu a mụ na unu nọ.
JOH 14:26 Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ọ ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu.
JOH 14:27 Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.
JOH 14:28 “Unu anụla na m gwara unu, ‘Ana m ala, ma lọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya, unu gaara aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna, nʼihi na Nna dị ukwuu karịa m.
JOH 14:29 Ugbu a, agwala m unu ihe a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru, unu enwee ike kwere.
JOH 14:30 Agaghị m agwa unu ọtụtụ okwu ọzọ nʼihi na eze na-achị ụwa a na-abịa. O nwekwaghị ike ọbụla nʼebe m nọ.
JOH 14:31 Ana m eme dịka Nna m nyere m nʼiwu, ka ụwa mara na m hụrụ Nna m nʼanya. “Bilienụ ugbu a ka anyị si ebe a pụọ.
JOH 15:1 “Mụ onwe m bụ ezigbo osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye ọrụ ubi.
JOH 15:2 Ọ na-egbuda alaka ọbụla dị nʼime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọbụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-egbucha, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ.
JOH 15:3 Ugbu a, e meela ka unu dịrị ọcha nʼihi okwu m gwara unu.
JOH 15:4 Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka alaka ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị nʼime m.
JOH 15:5 “Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla.
JOH 15:6 Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa.
JOH 15:7 Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya.
JOH 15:8 Nke a ga-abụrụ Nna m otuto na unu mịrị ọtụtụ mkpụrụ hie nne, ọ na-egosikwa na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.
JOH 15:9 “Dị ka Nna sị hụ m nʼanya, otu a ka m sị hụkwa unu nʼanya. Ya mere, nọgidenụ nʼime ịhụnanya m.
JOH 15:10 Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya.
JOH 15:11 Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke.
JOH 15:12 Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya.
JOH 15:13 Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya.
JOH 15:14 Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu.
JOH 15:15 Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m.
JOH 15:16 Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m.
JOH 15:17 Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya.
JOH 15:18 “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị.
JOH 15:19 A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị.
JOH 15:20 Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu.
JOH 15:21 Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m.
JOH 15:22 Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha.
JOH 15:23 Onye ọbụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị.
JOH 15:24 A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị.
JOH 15:25 Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’
JOH 15:26 “Mgbe Onye Ndụmọdụahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m.
JOH 15:27 Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite.
JOH 16:1 “Ihe ndị a niile ka m gwara unu ka unu ghara ịda.
JOH 16:2 Ha ga-esite nʼụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nʼezie, oge na-abịa mgbe onye ọbụla ga-egbu unu ga-echekwa na ọ na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a.
JOH 16:3 Ha ga-eme ihe ndị a nʼihi na ha amaghị Nna maọbụ m.
JOH 16:4 Ana m agwa unu ihe ndị a ka ọ ga-abụ na mgbe oge ga-eru, unu echeta na m gwara unu. Agwaghị m unu ihe ndị a na mbụ nʼihi na mụ na unu nọ mgbe ahụ.
JOH 16:5 Ma ugbu a, ana m alaghachikwuru onye ahụ zitere m. Ma ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu jụrụ m, ‘Olee ebe ị na-aga?’
JOH 16:6 Ma nʼihi na m gwara unu ihe ndị a, obi unu ejupụtala na mwute.
JOH 16:7 Nʼagbanyeghị nke a, aga m agwa unu eziokwu, ọ bụ maka ọdịmma unu ka m ji ala. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye Ndụmọdụ ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya.
JOH 16:8 Mgbe ọ bịara, ọ ga-eme ka ụwa mata ezughị oke nke nghọta ya banyere mmehie, na ezi omume na ikpe,
JOH 16:9 maka mmehie nʼihi na ha ekwenyeghị na m;
JOH 16:10 ma gbasara ezi omume, nʼihi na ana m alakwuru Nna, ebe unu na-apụghị ịhụ m ọzọ,
JOH 16:11 maka ikpe, nʼihi na e kpeela onyeisi ụwa a ikpe.
JOH 16:12 “Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ m ga-agwa unu. Ma ugbu a, unu agaghị anabatalị ha.
JOH 16:13 Ma mgbe Mmụọ eziokwu ahụ bịara, ọ ga-eduba unu nʼeziokwu niile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya, kama ọ bụ ihe niile ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe niile gaje ịbịa.
JOH 16:14 Ọ ga-enye m otuto, nʼihi na ọ ga-esite nʼaka m nata ihe ọ ga-akọrọ unu.
JOH 16:15 Ihe niile Nna nwere bụ nke m. Ọ bụ ya mere m ji sị, na ọ ga-ewere site nʼihe bụ nkem, kọwara ya unu.
JOH 16:16 “Ọ fọdụrụ nwantakịrị oge unu agaghị ahụkwa m. Ma mgbe nwantịntị oge gasịkwara, unu ga-ahụkwa m anya ọzọ.”
JOH 16:17 Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka o bu nʼuche mgbe ọ na-asị, ‘Nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma mgbe nwa oge gasịkwara unu ga-ahụkwa m,’ na ‘Nʼihi na ana m alakwuru Nna’?”
JOH 16:18 Ha na-asị, “Gịnị ka okwu a pụtara bụ ‘nwa oge nta’? Anyị aghọtaghị ihe ọ na-ekwu.”
JOH 16:19 Jisọs matara na ha chọrọ ịjụ ya ihe banyere nke a, nʼihi ya ọ sịrị ha, “Unu na-ajụrịta onwe unu ihe okwu m pụtara mgbe m sịrị, ‘Na nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma nwa mgbe nta unu ga-ahụkwa m’?
JOH 16:20 Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, unu ga-akwa akwa ma nwekwa obi mwute, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma iru ụjụ unu ga-aghọrọ unu ọṅụ.
JOH 16:21 Mgbe ime na-eme nwanyị, ọ na-anọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Mgbe ọ mụsịrị nwa ya, ọ dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nʼihi ọṅụ na a mụpụtala nwa nʼelu ụwa.
JOH 16:22 Unu nọ nʼọnọdụ iru ụjụ ugbu a, ma aga m ahụ unu anya ọzọ, obi unu ga-ejupụta nʼọṅụ. Mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụ unu ọṅụ unu.
JOH 16:23 Ma nʼụbọchị ahụ, unu agakwaghị arịọ m ihe ọbụla. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ihe ọbụla unu ga-arịọ Nna m nʼaha m, ọ ga-enye unu.
JOH 16:24 Ruo ugbu a, ọ dịbeghị ihe unu rịọrọ nʼaha m. Rịọọnụ, unu ga-arịọta, ka ọṅụ unu zukwaa oke.
JOH 16:25 “Eji m ilu na-agwa unu okwu ugbu a, ma oge na-abịa mgbe m na-agaghị ejikwa ilu gwa unu okwu. Mgbe ahụ ka m ga-akọwara unu niile ihe banyere Nna m nʼụzọ unu ga-aghọta ya.
JOH 16:26 Nʼụbọchị ahụ, unu ga-arịọ ihe nʼaha m. Asịghị m unu na m ga-arịọ Nna ihe nʼihi unu.
JOH 16:27 Nʼihi na Nna m nʼonwe ya hụrụ unu nʼanya, nʼihi na unu hụrụ m nʼanya kwerekwa na m si nʼebe Chineke nọ bịa.
JOH 16:28 Esi m nʼebe Nna nọ pụta, bịa nʼime ụwa. Ana m ahapụkwa ụwa ịlaghachikwuru Nna.”
JOH 16:29 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee, ugbu a ka okwu gị doro anya. Ọ bụkwaghị ilu ka i na-atụ.
JOH 16:30 Ugbu a ka o doro anyị anya na ị maara ihe niile. Ọ bakwaghị uru ka onye ọbụla jụọ gị ihe ọbụla. Nʼihi nke a, anyị kwere na i si nʼebe Chineke nọ bịa.”
JOH 16:31 Jisọs zara ha, “Unu ekwerela ugbu a?
JOH 16:32 Lee! Oge na-abịa, oge ahụ eruola, mgbe unu ga-agbasacha. Onye ọbụla nʼụlọ nke ya. Mgbe ahụ, unu ga-ahapụ naanị m, ma ọ bụghị naanị m nọ nʼihi na mụ na Nna m nọ.
JOH 16:33 “Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa.”
JOH 17:1 Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o leliri anya nʼeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto.
JOH 17:2 I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi.
JOH 17:3 Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa.
JOH 17:4 Enyere m gị otuto nʼụwa site nʼịrụzu ọrụ niile ị nyere m ka m rụọ.
JOH 17:5 Ma ugbu a, Nna, nye m otuto nʼihu gị, ụdị otuto ahụ m nwere nʼihu gị tupu e kee ụwa.
JOH 17:6 “Emere m ka ndị ahụ i siri nʼụwa kponye m mara aha gị. Ha bụ ndị nke gị, i nyere m ha, ha debekwara okwu gị.
JOH 17:7 Ugbu a, ha amarala na ihe niile i nyere m si nʼaka gị bịa.
JOH 17:8 Ma ugbu a, enyela m ha okwu ahụ i nyere m, ha nabatakwara ya, marakwa nʼeziokwu na-esi m nʼebe ị nọ bịa. Ha kwenyekwara na ọ bụ gị zitere m.
JOH 17:9 Ana m ekpere ha ekpere, ọ bụghị nʼihi ụwa ka m na-ekpe ekpere. Kama ana m ekpe ekpere banyere ndị ahụ i nyere m, nʼihi na ha bụkwa ndị nke gị.
JOH 17:10 Ihe niile m nwere bụ nke gị, ihe niile i nwere bụkwa nke m. E sitere na ha mee ka otuto m pụta ìhè.
JOH 17:11 Ugbu a, anọghịkwa nʼime ụwa, ma ha ka nọ nʼime ụwa, ana m alaghachikwute gị. Ya mere, Nna dị nsọ, chebe ha nke ọma site nʼike nke aha gị, bụ aha nke ahụ i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu.
JOH 17:12 Mgbe mụ na ha nọ nʼụwa, echebere m ha site nʼaha gị nke i nyere m. Echebekwara m ha, o nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha lara nʼiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa nke ịla nʼiyi, ka e mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru.
JOH 17:13 “Ma ugbu a, ana m alọghachikwute gị, ma ana m ekwu ihe ndị a nʼụwa ugbu a ka ha nwee nʼọṅụ m, nʼebe o zuruoke nʼime ha.
JOH 17:14 Enyela m ha okwu gị. Ma nʼihi ya, ụwa akpọọla ha asị. Nʼihi na ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa.
JOH 17:15 Ekpeghị m ekpere ka iwepụ ha nʼụwa, kama ka ịnapụta ha site nʼaka ajọ onye ahụ.
JOH 17:16 Ha onwe ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụkwaghị onye nke ụwa.
JOH 17:17 Were eziokwu doo ha nsọ, okwu gị bụ eziokwu.
JOH 17:18 Dị ka i siri zite m nʼụwa, otu a ka m na-ezipụkwa ha nʼụwa.
JOH 17:19 Ọ bụkwa nʼihi ha ka m jiri debe onwe m nsọ, ka ha onwe ha bụrụkwa ndị e doro nsọ nʼeziokwu.
JOH 17:20 “Ekpeghị m ekpere a nʼihi ndị a naanị. Kama ana m ekpekwa ekpere a nʼihi ndị niile ga-ekwere na mụ, site nʼokwu ha.
JOH 17:21 Ka ha niile bụrụ otu, Nna, dị ka ị nọ nʼime m mụ a nọrọ nʼime gị. Ka ha nọrọkwa nʼime anyị ka ụwa kwere na ọ bụ gị zitere m.
JOH 17:22 Enyere m ha otuto nke i nyere m, ka ha bụrụ otu dị ka anyị onwe anyị si bụrụ otu;
JOH 17:23 Mụ onwe m nʼime ha, gị onwe gị nʼime m. Ka e mee ka ha bụrụ otu nʼụzọ zuruoke, ka ụwa matakwa na ọ bụ gị zitere m, na ị hụkwara ha nʼanya dị ka ị si hụ m nʼanya.
JOH 17:24 “Nna, achọrọ m ka ndị niile i nyere m soro m nọrọ ebe m nọ. Ka ha hụ otuto m nke i nyere m nʼihi na ị hụrụ m nʼanya tupu atọọ ntọala nke ụwa.
JOH 17:25 “Nna onye ezi omume, ụwa amaghị gị. Ma amaara m gị. Ndị a matakwara na ọ bụ gị zitere m.
JOH 17:26 Emekwara m ka ha mara aha gị. Aga m agakwa nʼihu ime ka ha mara ya. Ka ịhụnanya ahụ i nwere nʼebe m nọ dịgide nʼime ha, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime ha.”
JOH 18:1 Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya rịdara ndagwurugwu iyi Kidrọn rigorokwa nʼofe nke ọzọ, ebe e nwere otu ogige, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime ya.
JOH 18:2 Judas, onye rara ya nye matakwara ebe ahụ. Nʼihi na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-anọ nʼebe ahụ ọtụtụ oge.
JOH 18:3 Ya mere, Judas duuru otu ndị agha, na ụfọdụ ndị ozi sitere nʼetiti ndịisi nchụaja na ndị Farisii bịa nʼebe ahụ. Ha chịkwa ọwaọkụ, oriọna na ngwa agha.
JOH 18:4 Ebe Jisọs maara ihe niile na-akwado ịbịakwasị ya, ọ pụtara sị ha, “Onye ka unu na-achọ?”
JOH 18:5 Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụ m” (Judas onye ahụ rara ya nye so ha guzo nʼebe ahụ.)
JOH 18:6 Mgbe Jisọs gwara ha, “Ọ bụ m,” ha laghachiri azụ, daa nʼala.
JOH 18:7 Ọzọ ọ jụkwara ha, “Onye ka unu na-achọ?” Ha sịrị, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.”
JOH 18:8 Jisọs zara, “Agwara m unu na Ọ bụ m. Ọ bụrụ na unu na-achọ m, hapụnụ ndị a ka ha laa.”
JOH 18:9 Nke a bụ iji mezuo okwu ahụ o kwuru na mbụ, “Etufughị m onye ọbụla nʼime ndị ahụ i nyere m.”
JOH 18:10 Ya mere Saimọn Pita, onye ji mma agha, mịpụtara ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya. Aha ohu ahụ bụ Malkus.
JOH 18:11 Ma Jisọs gwara Pita, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya! Ọ bụ na mụ agaghị aṅụ site nʼiko ahụ Nna m nyere m ka m ṅụọ?”
JOH 18:12 Ya mere ndị agha ahụ na ọchịagha ha, na ndị na-ejere ndị Juu ozi, jidere Jisọs kee ya agbụ.
JOH 18:13 Ha buru ụzọ duru ya jekwuru Anas, onye bụ nna nwunye Kaịfas. Onye bụ onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ.
JOH 18:14 Kaịfas bụkwa onye ahụ dụrụ ndị ndu ndị Juu ọdụ, sị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile.
JOH 18:15 Saimọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ ya sooro Jisọs. Nʼihi na onye nke ahụ na-eso ụzọ ya bụ onye onyeisi nchụaja maara nke ọma, o sooro Jisọs banye nʼobi onyeisi nchụaja.
JOH 18:16 Ma Pita na-eguzo nʼezi nʼọnụ ụzọ. Onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya, nke onyeisi nchụaja maara nke ọma, pụrụ nʼezi gwa nwaagbọghọ ahụ na-eche ọnụ ụzọ okwu, ma kpọbata Pita.
JOH 18:17 Nwaagbọghọ ahụ sịrị Pita, “Ọ bụ na ị bụghị otu nʼime ndị na-eso ụzọ nwoke a?” Pita sịrị, “Mba! Abụghị m.”
JOH 18:18 Ndị ohu na ndị nche kwanyere ọkụ nʼihi na oyi na-atụ. Ha guzoro nʼebe ahụ na-anya ọkụ. Pita soro ha guzo na-anyakwa ọkụ.
JOH 18:19 Nʼoge ahụ onyeisi nchụaja ahụ jụrụ Jisọs banyere ndị na-eso ụzọ ya, na ozizi ya.
JOH 18:20 Jisọs zara ya, “Nʼihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu niile m kwuru. A kuziri m ihe nʼime ụlọ ekpere na nʼime ụlọnsọ ukwu ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọbụla na nzuzo.
JOH 18:21 Gịnị mere i ji ajụ m? Jụọ ndị niile gere m ntị! Ha makwaara ihe niile m kwuru.”
JOH 18:22 Mgbe o kwuru nke a, otu onye nʼime ndị na-eje ozi guzo nʼakụkụ ya, mara Jisọs ụra nʼihu, sị, “Ọ bụ otu a ka ị si aza onyeisi nchụaja ajụjụ?”
JOH 18:23 Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ m kwuru, gbaa ama megide okwu ọjọọ dị otu a, ma ọ bụrụ na m kwuru eziokwu, gịnị mere i ji ama m ụra.”
JOH 18:24 Ya mere, Anas kere ya agbụ zigara ya Kaịfas onyeisi nchụaja.
JOH 18:25 Ma dịka Saimọn Pita ka guzo nʼebe ahụ na-anya ọkụ, ha sịrị ya, “Ọ bụ na ị bụghị otu onye nʼime ndị na-eso ụzọ ya?” Ma ọ gọrọ agọ sị, “Abụghị m ya.”
JOH 18:26 Otu nʼime ndị ohu onyeisi nchụaja, bụ onye ikwu nwoke ahụ Pita bipụrụ ntị, sịrị, “Ọ bụ na m ahụghị gị na ya nʼime ogige ahụ?”
JOH 18:27 Ma Pita gọkwara agọ ọzọ. Nʼotu mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa.
JOH 18:28 Mgbe ahụ, ha sitere nʼụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nʼụlọeze Pailet. Ọ bụkwa nʼisi ụtụtụ, ma ha onwe ha abanyeghị nʼime ụlọeze ahụ nʼihi na ha achọghị imerụ onwe ha, ka ha nwee ike isoro rie nri na Mmemme Ngabiga.
JOH 18:29 Pailet gakwuru ha nʼezi sị, “Gịnị bụ ebubo unu na-ebo nwoke a?”
JOH 18:30 Ha zara ma sị ya, “Ọ bụrụ na onye a abụghị onye arụrụala, anyị agaraghị akpọtara gị ya.”
JOH 18:31 Pailet sịrị, “Durunụ ya pụọ kpee ya ikpe nʼonwe unu dị ka iwu unu si dị.” Ndị Juu sịrị ya, “Ma anyị enweghị ikike igbu onye o bụla.”
JOH 18:32 Nke a mere iji mezuo okwu ahụ Jisọs kwuru banyere ụdị ọnwụ ọ gaje ịnwụ.
JOH 18:33 Mgbe ahụ Pailet baghachiri nʼime ụlọeze ahụ, zie ozi ka a kpọọrọ ya Jisọs. Ọ jụrụ ya, “Ị bụ eze ndị Juu?”
JOH 18:34 Jisọs zara, “Ị na-ajụ nke a nʼonwe gị ka ọ bụ ihe ndị ọzọ gwara gị banyere m?”
JOH 18:35 Pailet zara, “Abụ m onye Juu? Ọ bụ ndị ala gị na ndịisi nchụaja unu kpọtaara m gị. Gịnị ka i mere?”
JOH 18:36 Jisọs zara, “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara ịlụrụ m ọgụ iji gbochie m ịdaba nʼaka ndị Juu. Ma ugbu a, alaeze m abụghị nke ụwa a.”
JOH 18:37 Pailet sịrị ya, “Ya bụ na ị bụ eze?” Jisọs zara, “Gị onwe gị kwuru na m bụ eze. Amụrụ m nʼihi nke a, ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji bi a nʼụwa ịgba ama banyere eziokwu. Onye ọbụla hụrụ eziokwu nʼanya na-ege m ntị.”
JOH 18:38 Pailet sịrị ya, “Gịnị bụ eziokwu?” Mgbe o kwuchara nke a, ọ pụrụ jekwuuru ndị Juu ọzọ sị ha, “Ọ dịghị ihe ọbụla m chọpụtara megidere ya.
JOH 18:39 Ma ọ bụ omenaala unu, na m ga-ahapụrụ unu otu onye mkpọrọ nʼoge Mmemme Ngabiga. Unu chọrọ ka m hapụrụ unu ‘eze ndị Juu’?”
JOH 18:40 Ha tiri mkpu ọzọ sị, “Ọ bụghị nwoke a, ma hapụrụ anyị Barabas.” Barabas bụ onye abalị dị egwu.
JOH 19:1 Mgbe ahụ, Pailet kpụụrụ Jisọs, a pịa ya ihe.
JOH 19:2 Ndị agha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi, yinyekwa ya uwe mwụda na-acha odo odo.
JOH 19:3 Ha bịakwutere ya ọtụtụ mgbe na-asị, “Ekele, gị Eze ndị Juu!” Ha na-amakwa ya ụra nʼihu.
JOH 19:4 Pailet pụkwara nʼezi ọzọ sị ha, “Lee, ana m akpọpụtara unu ya, ka unu mara na achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.”
JOH 19:5 Mgbe Jisọs yi okpu ogwu na uwe odo odo pụta, Pailet sịrị ha, “Lekwanụ nwoke ahụ!”
JOH 19:6 Ngwangwa, ndịisi nchụaja na ndị nche hụrụ ya, ha tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” Pailet sịrị ha, “Kpọrọnụ ya kpọgbuo ya nʼonwe unu. Achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.”
JOH 19:7 Ndị Juu zara ya, “Anyị nwere iwu, dị ka iwu ahụ siri dị, ihe kwesiri ya bụ ọnwụ, nʼihi na ọ kpọrọ onwe ya Ọkpara Chineke.”
JOH 19:8 Mgbe Pailet nụrụ nke a, oke egwu tụrụ ya karịa.
JOH 19:9 Ọ laghachiri azụ nʼime ụlọeze ahụ, jụọ Jisọs, “Olee ebe i siri bịa?” Ma Jisọs azaghị ya ihe ọbụla.
JOH 19:10 Pailet sịrị ya, “Ị na-agba m nkịtị? Ọ bụ na ị maghị na m nwere ike ịkpọgide gị nʼobe, nweekwa ike ịhapụ gị ka ị laa?”
JOH 19:11 Jisọs zara ya, “Ị garaghị enwe ike ọbụla nʼebe m nọ, ma ọ bụrụ na o siteghị nʼelu rute gị aka. Nke a mere mmehie onye duru m nye nʼaka gị ji karịa.”
JOH 19:12 Site na mgbe ahụ Pailet chọsịrị ike ịhapụ ya. Ma ndị Juu tisiri mkpu ike sị, “Ị hapụ nwoke a ka ọ laa, ị bụkwaghị enyi Siza. Nʼihi na onye ọbụla na-eme onwe ya eze na-elelị Siza.”
JOH 19:13 Mgbe Pailet nụrụ okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jisọs nʼezi, nọdụkwa ala nʼoche ikpe ya dị nʼebe a na-akpọ Pevumentị (maọbụ Gabata nʼasụsụ Hibru).
JOH 19:14 Ọ bụ nʼihe dịka nʼoge ehihie nke ụbọchị nkwadebe maka oriri Ngabiga. Ọ sịrị ndị Juu, “Leenụ eze unu!”
JOH 19:15 Ma ha tiri mkpu, “Kpọpụ ya, Kpọpụ ya! Kpọgide ya nʼobe.” Pailet jụrụ ha, “Unu chọrọ ka m kpọgide eze unu nʼobe?” Ma ndịisi nchụaja zara, “Anyị enweghị eze ọzọ karịa Siza.”
JOH 19:16 Mgbe ahụ, o nyefere ya nʼaka ha, ka ha kpọgide ya nʼobe. Ha kpọọrọ Jisọs pụọ.
JOH 19:17 O buuru obe ya gaa nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi (nke pụtara Gọlgọta nʼasụsụ Hibru).
JOH 19:18 Nʼebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe, ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ. Otu onye nʼaka nri ya, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
JOH 19:19 O nwere ihe Pailet dere kụpanye nʼelu obe ahụ. Ihe o dere bụ nke a: Jisọs onye Nazaret, Eze ndị Juu.
JOH 19:20 Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe a o dere, nʼihi na ebe a kpọgburu Jisọs dị nso nʼobodo ahụ. E dekwara ya nʼasụsụ Hibru, Griik na Latin.
JOH 19:21 Ndịisi nchụaja nke ndị Juu gwara Pailet sị, “Edela na ọ bụ Eze ndị Juu, kama dee na nwoke a sịrị, abụ m eze ndị Juu.”
JOH 19:22 Ma Pailet zara, “Ihe m dere, edeela m ya.”
JOH 19:23 Mgbe ndị agha kpọgidechara Jisọs nʼobe, ha kere uwe ya ụzọ anọ. Onye ọbụla nʼime ha nwetara otu ụzọ. Ha chịrị uwe mwụda ya nke a na-adụghị adụ, kama a kpara ya akpa site nʼelu ya ruo nʼala ya.
JOH 19:24 Ha gwarịtara onwe ha, “Ka anyị hapụnụ ịdọka ya, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere i were ya.” Nke a bụ iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ha kere uwe m nʼetiti onwe ha, feekwa nza banyere uwe mwụda m.” Nke a bụ ihe ndị agha ahụ mere.
JOH 19:25 Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs.
JOH 19:26 Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya ka o guzo nʼakụkụ ya, ọ sịrị nne ya, “Nwanyị lee nwa gị nwoke.”
JOH 19:27 Ọ sịrị onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị.” Site nʼoge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa nʼụlọ nke ya.
JOH 19:28 Nʼikpeazụ, mgbe Jisọs matara na ihe niile emezuola. Ma iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ọ sịrị, “Akpịrị na-akpọ m nkụ.”
JOH 19:29 Otu ite mmanya ọra dọrọ nso nʼebe ahụ. Ha were ogbo denye nʼime mmanya ahụ, kenye ogbo ahụ nʼosisi hisọp welie ya elu chee ya nʼọnụ.
JOH 19:30 Mgbe Jisọs detụrụ mmanya ahụ ọnụ, ọ sịrị, “Ọ gwụchaala.” O hulatara isi ya, kubie ume.
JOH 19:31 Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị ahụ a kpọgidere nʼobe nọgide nʼebe ahụ ka chi bọọ, nʼihi na ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe. Echi ya bụ ga-abụ ụbọchị izuike pụrụ iche. Ha rịọọrọ Pailet ka a gbajisie ha ụkwụ ma bupụkwa ahụ ha.
JOH 19:32 Ndị agha ahụ bịara gbajie ụkwụ onye nke mbụ na onye nke ọzọ a kpọgburu ha na ya.
JOH 19:33 Ma mgbe ha bịaruru nʼebe Jisọs nọ, ha hụrụ na ọ nwụọlarị. Nʼihi nke a, ha agbajighị ụkwụ ya.
JOH 19:34 Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ùbe mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara.
JOH 19:35 Onye hụrụ ihe ndị a gbara ama ka unu kwere, ama ya bụ eziokwu, ọ matakwara na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.
JOH 19:36 Ihe ndị a niile mere ka e mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọbụla nke a ga-agbaji.”
JOH 19:37 E dekwara nʼebe ọzọ nʼakwụkwọ sị, “Ha ga-elegide onye ahụ ha mapuru ahụ anya.”
JOH 19:38 Mgbe ihe ndị a gasịrị, otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere Arimatia, onye na-eso ụzọ Jisọs na nzuzo, nʼihi egwu ndị Juu, jekwuuru Pailet rịọ ka o nye ya ikike iburu ahụ Jisọs, Pailet kwere, ya mere ọ bịara buru ahụ ya.
JOH 19:39 Nikọdimọs, onye ahụ bịakwutere Jisọs nʼabalị na mbụ, bịakwara. O wetara máá na aloos a gwakọtara agwakọta, nke ọtụtụ ya ruru ihe dịka kilogram iri atọ na anọ.
JOH 19:40 Ha buuru ahụ Jisọs, tee ya ụda ndị ahụ, fụchikwaa ya nʼakwa ọcha linin dịka omenaala olili ozu nke ndị Juu si dị.
JOH 19:41 Ebe ahụ a kpọgidere ya nʼobe dị nʼotu ubi a gbara ogige. Nʼime ogige a, otu ili ọhụrụ dị na ya nke e jibeghị lie onye ọbụla.
JOH 19:42 Nʼihi na ọ bụ ụbọchị Nkwadebe nke ndị Juu, nakwa nʼihi na ili ahụ dị nso, ha dọnyere ahụ Jisọs nʼime ya.
JOH 20:1 Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ.
JOH 20:2 O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!”
JOH 20:3 Ya mere Pita na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ.
JOH 20:4 Ha abụọ jiri ọsọ na-aga, ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya gbakarịrị Pita nʼọsọ buru ya ụzọ ruo nʼili ahụ.
JOH 20:5 O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime.
JOH 20:6 Ya mere Saimọn Pita, onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala,
JOH 20:7 ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ.
JOH 20:8 Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa.
JOH 20:9 (Ruo nʼoge a, ha aghọtabeghị site nʼakwụkwọ nsọ na ọ ghaghị i si nʼọnwụ bilie.)
JOH 20:10 Emesịa ndị na-eso ụzọ ya laghachiri nʼụlọ ha.
JOH 20:11 Ma Meri guzo nʼakụkụ ili ahụ na-ebe akwa. Mgbe ọ nọ na-ebe akwa, o hulatara ala nyoo anya nʼime ili ahụ
JOH 20:12 hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ Jisọs.
JOH 20:13 Ha sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?” Ọ sịrị ha, “Ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.”
JOH 20:14 Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs.
JOH 20:15 Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.”
JOH 20:16 Jisọs sịrị ya, “Meri.” Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, “Raboni!” (nke pụtara “Onye nkuzi.)”
JOH 20:17 Jisọs sịrị ya, “Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, ‘Ana m alakwuru Nna m na Nna unu. Chineke m na Chineke unu.’ ”
JOH 20:18 Meri Magdalin gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, “Ahụla m Onyenwe anyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ bụ ya gwara ya ihe ndị a niile.
JOH 20:19 Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!”
JOH 20:20 Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị.
JOH 20:21 Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.”
JOH 20:22 Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ.
JOH 20:23 Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.”
JOH 20:24 Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara.
JOH 20:25 Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.”
JOH 20:26 Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.”
JOH 20:27 Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, “Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere.”
JOH 20:28 Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na Chineke m!”
JOH 20:29 Ma Jisọs sịrị ya, “I kweere nʼihi na ị hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere.”
JOH 20:30 Ọ dị ọtụtụ ihe ịrịbama ndị ọzọ Jisọs rụrụ nʼihu ndị na-eso ụzọ ya. Ma edeghị ha nʼime akwụkwọ a.
JOH 20:31 Ma e dere ihe ndị a niile ka unu kwere na Jisọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke. Nʼihi na ọ bụ site nʼikwere ka unu ga-eji nweta ndụ ọhụrụ site nʼaha ya.
JOH 21:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nʼakụkụ osimiri nke Tiberịas, lee otu o si mee.
JOH 21:2 Ụfọdụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saimọn Pita na Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), na Nataniel, onye Kena nke Galili na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya.
JOH 21:3 Saimọn Pita sịrị ha, “Ana m aga igbu azụ.” Ha sịrị, “Anyị ga-eso gị.” Ha biliri gaa, banye nʼime ụgbọ mmiri. Ma nʼabalị ahụ niile ha egbuteghị ihe ọbụla.
JOH 21:4 Mgbe chi na-abọ Jisọs guzoro nʼakụkụ mmiri. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ Jisọs.
JOH 21:5 Jisọs sịrị ha, “Ụmụntakịrị, unu gbutere azụ ọbụla?” Ha zara ya, “Mba.”
JOH 21:6 Ọ gwara ha, “Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ.” Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya.
JOH 21:7 Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na “ọ bụ Onyenwe anyị,” ọ yiiri uwe ya (nʼihi na ọ gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ.
JOH 21:8 Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise.
JOH 21:9 Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha.
JOH 21:10 Jisọs gwara ha, “Wetanụ ụfọdụ nʼime azụ ndị ahụ unu gbutere ugbu a.”
JOH 21:11 Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya.
JOH 21:12 Jisọs sịrị ha, “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ọ dịghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ị bụ onye?” Nʼihi na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị.
JOH 21:13 Jisọs bịara were achịcha ahụ nye ha. Otu ahụ ka o mekwara azụ ahụ.
JOH 21:14 Nke a bụ ugboro atọ Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie.
JOH 21:15 Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”
JOH 21:16 Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.”
JOH 21:17 Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m.
JOH 21:18 Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.”
JOH 21:19 O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.”
JOH 21:20 Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”)
JOH 21:21 Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?”
JOH 21:22 Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.”
JOH 21:23 Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?”
JOH 21:24 Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu.
JOH 21:25 Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.
ACT 1:1 Ezigbo enyi m Tiofilọs, nʼakwụkwọ m nke mbụ m dere gị banyere ihe niile Jisọs malitere ime nakwa ikuzi,
ACT 1:2 ruo nʼụbọchị e mere ka ọ laghachi nʼeluigwe mgbe o sitere nʼike Mmụọ nsọ nyesịa ndị na-eso ụzọ ya iwu, bụ ndị ọ họpụtara.
ACT 1:3 Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ nke ọnwụ, o gosiri ha onwe ya nʼụzọ dị iche iche nʼebe o doro anya na ya dị ndụ. O mere ka ha hụ ya anya nʼime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere alaeze Chineke.
ACT 1:4 Nʼotu oge, ọ nọnyeere ha na nri, o nyere ha iwu a, “Unu esila na Jerusalem pụọ, kama cherenụ nkwa nke Nna m, nke unu nụrụ site nʼọnụ m.
ACT 1:5 Nʼihi na Jọn jiri mmiri mee unu baptizim, ma nʼoge na-adịghị anya, a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
ACT 1:6 Mgbe ha gbakọrọ, ha jụrụ ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugbu a ka i ga-enyeghachi Izrel alaeze ahụ?”
ACT 1:7 Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụghị ọrụ unu ịmata oge na mgbe Nna m na-akwado ihe o zubere ime nʼikike nke onwe ya.
ACT 1:8 Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ.”
ACT 1:9 Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha.
ACT 1:10 Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka ọ na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso.
ACT 1:11 Ha sịrị, “Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe.”
ACT 1:12 Ha sitere nʼUgwu a na-akpọ Oliv nke dị Jerusalem nso, njem nke otu ụbọchị izuike, laghachi na Jerusalem.
ACT 1:13 Mgbe ha batara nʼobodo, ha rigoro nʼime ụlọ ahụ dị nʼụlọ elu, ebe ha na-anọ. Ndị a bụ ndị nọ nʼụlọ ahụ: Pita, Jọn, Jemis na Andru, Filip na Tọmọs, Batalomi na Matiu, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas nwa Jemis.
ACT 1:14 Ndị a niile ji otu obi nọgidesie ike nʼekpere. Ndị sonyere ha bụ ụfọdụ ndị inyom na Meri nne Jisọs, na ụmụnna ya.
ACT 1:15 Nʼoge ahụ, Pita bilitere nʼetiti ndị kwere ekwe ọnụọgụgụ ha dị ihe dị ka narị na iri abụọ, sị,
ACT 1:16 “Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo banyere Judas onye duuru ndị jidere Jisọs bịa. Mmụọ Nsọ kwuru na nke a ga-eme mgbe o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu nʼoge gara aga.
ACT 1:17 Ọ bụ otu nʼime anyị. O nwere oke nʼime ọrụ a.”
ACT 1:18 Ego ọ natara nʼihi ọrụ ọjọọ ya ka o jiri zụọ ala. Nʼala ahụ ka ọ dara sụọ isi nʼala, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa.
ACT 1:19 Ndị niile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nʼihi ya, ha kpọrọ ala ahụ nʼasụsụ ha Akeldama, nke pụtara Ala Ọbara.
ACT 1:20 Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma: “ ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’ na, “ ‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’
ACT 1:21 Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị,
ACT 1:22 bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.”
ACT 1:23 Ya mere, ha họpụtara mmadụ abụọ, Josef onye a na-akpọ Basabas (aha ya ọzọ bụkwa Jọstus) na Mataias.
ACT 1:24 Ha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ niile. Gosi anyị onye ị họpụtara nʼime mmadụ abụọ ndị a.
ACT 1:25 Ka ọ bụrụ onyeozi na onyendu nke ga-anọchi anya Judas onye nke hapụrụ ma gawa ebe o kwesiri ka ọ gaa.”
ACT 1:26 Ha fere ha nza. Nza ahụ makwara Mataias, ha gụnyere ya dị ka otu nʼime ndị ozi iri na otu ahụ.
ACT 2:1 Mgbe ụbọchị Pentikọọsụ ruru, ha niile zukọtara nʼotu ebe.
ACT 2:2 Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ.
ACT 2:3 Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu.
ACT 2:4 Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike.
ACT 2:5 Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ndị si na mba dị iche iche nʼokpuru eluigwe.
ACT 2:6 Igwe mmadụ gbakọtara nʼọnọdụ mgbagwoju anya mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, nʼihi na ha nụrụ ka ha na-asụ asụsụ nke onye ọbụla nʼime ha na-aghọta, nʼasụsụ obodo ha dị iche iche.
ACT 2:7 Nʼoke iju anya, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Ndị a niile na-ekwu okwu ha abụghị ndị Galili?
ACT 2:8 Gịnị mere onye ọbụla nʼime anyị ji na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ ala anyị dị iche iche?
ACT 2:9 Ndị Patia, na ndị Midia, na ndị Elam, ndị bikwa nʼime Mesopotamịa, ndị Judịa, na ndị Kapadosia, ndị Pọntọs, na ndị Eshịa,
ACT 2:10 ndị Frigia, na ndị Pamfilia, na ndị Ijipt, na ndị akụkụ Libiya nke dị Sirini nso, na ndị ọbịa si na Rom bịa
ACT 2:11 (ndị Juu na ndị kwere nʼokpukpe ndị Juu). Ndị Kriit na ndị Arab; anyị na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ anyị dị iche iche banyere ọrụ ebube Chineke.”
ACT 2:12 O juru ha anya, gbaakwa ha gharịị. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka nke a bụ?”
ACT 2:13 Ma ụfọdụ ndị ọzọ na-akwa ha emo na-asị, “Ndị a bụ ndị mmanya na-egbu.”
ACT 2:14 Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu gwa ọgbakọ ahụ okwu, “Ndị Juu na unu ndị bi na Jerusalem, matanụ nke a, geekwanụ ntị na ihe m na-ekwu.
ACT 2:15 Ọ bụghị mmanya na-egbu ndị a dị ka unu chere. Lee, ọ bụ naanị elekere itoolu nke ụtụtụ na-akụ.
ACT 2:16 Mba, nke a bụ mmezu ihe Juel onye amụma kwuru,
ACT 2:17 “ ‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ, ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
ACT 2:18 Ọ bụladị ndị ohu m, nwoke ha na nwanyị nʼime ha, ka m ga-awụkwasị Mmụọ m. Ha ga-ebukwa amụma.
ACT 2:19 Aga m egosi ihe ịtụnanya na mbara eluigwe, gosikwa ihe ịrịbama nʼụwa na nʼokpuru ụwa, ọbara na ọkụ na alulu anwụrụ ọkụ.
ACT 2:20 Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube.
ACT 2:21 Ọ ga-erukwa, na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.’
ACT 2:22 “Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ.
ACT 2:23 Onye a ka e weere nyefee unu nʼaka site na nzube nke Chineke buru ụzọ tụọ atụmatụ ya, na dịka o siri mara na mbụ, ọ bụ ya ka unu gburu ma kpọgidekwa nʼobe site nʼaka ndị na-amaghị iwu.
ACT 2:24 Ma Chineke emela ka o site nʼọnwụ bilie mgbe ọ tọpụchara ihe mgbu nke ọnwụ, nʼihi na ọnwụ enweghị ike ijide ya.
ACT 2:25 Devid kwuru banyere ya, “ ‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgide nʼihu m mgbe niile. Nʼihi na ọ nọ nʼaka nri m. Agaghị m ama jijiji.
ACT 2:26 Ya mere, ọṅụ jupụtara m obi, ire m na-aṅụrịkwa ọṅụ; anụ ahụ m ga-ezukwa ike nʼolileanya,
ACT 2:27 nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ, ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.
ACT 2:28 I mere ka m mara ụzọ nke ndụ; ị ga-emekwa ka m jupụta nʼọṅụ nʼihu gị.’
ACT 2:29 “Ụmụnna m, eji m nkwuwa okwu na-agwa unu banyere nna nna anyị Devid, bụ onye nwụrụ anwụ e lie ya. Ili ya dịkwa nʼetiti anyị taa.
ACT 2:30 Ma ọ bụ onye amụma marakwa na Chineke jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa na otu nʼime ụmụ ya ga-anọkwasị nʼocheeze ya.
ACT 2:31 Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure.
ACT 2:32 Ọ bụ Jisọs a ka Chineke mere ka ọ dị ndụ ọzọ. Anyị niile bụkwa ndị akaebe banyere ya.
ACT 2:33 Ebe ọ bụ na e buliela ya elu nʼaka nri Chineke. Ọ natala Mmụọ Nsọ dịka Nna ya kwere na nkwa. Ihe a unu na-ahụ na nke unu na-anụ bụ onyinye ya ọ wụkwasịrị anyị.
ACT 2:34 Ọ dịghị oge Devid jiri rigoro nʼeluigwe, ma ya onwe ya sịrị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m,
ACT 2:35 ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” ’
ACT 2:36 “Ya mere, ana m eme ka ezinaụlọ Izrel niile mara nke ọma, na Chineke emeela Jisọs a onye unu kpọgidere nʼobe ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst.”
ACT 2:37 Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, akọnuche ha mara ha ikpe. Ha sịrị Pita na ndị ozi ndị ọzọ, “Ụmụnna, gịnị ka anyị ga-eme?”
ACT 2:38 Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ unu niile. Ka e mekwa unu baptizim nʼaha Jisọs Kraịst, maka mgbaghara mmehie unu. Unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ.
ACT 2:39 Nkwa a dịrị unu na ụmụ ụmụ unu na mmadụ niile nọ nʼebe dị anya, dịkwara ndị niile Onyenwe anyị Chineke ga-akpọ ka ha bịakwute ya.”
ACT 2:40 O jiri ọtụtụ okwu ndị ọzọ gbaa ama, ma dụọkwa ha ọdụ sị, “Sitenụ nʼetiti ọgbọ a jọrọ njọ zọpụta onwe unu.”
ACT 2:41 E mere ndị nabatara okwu ya baptizim, ha dị ihe ruru puku mmadụ atọ, a gụnyere nʼọnụọgụgụ ha.
ACT 2:42 Ha nyefere onwe ha nʼozizi nke ndị ozi, ya na ife ofufe na ịnyawa achịcha nakwa ikpe ekpere.
ACT 2:43 Onye ọbụla nʼime ha jupụtara na egwu, nʼihi na ndị ozi na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube, na ihe ịrịbama dị iche iche.
ACT 2:44 Ndị niile kwere ekwe nọkọtara ọnụ, nwekọkwaa ihe niile ọnụ.
ACT 2:45 Ha rere ihe ha nwere na nke ha kpatara, kenye onye ọbụla dịka mkpa ya siri dị.
ACT 2:46 Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele.
ACT 2:47 Dịka ha gara nʼihu na-eto Chineke, ha nwetara ihuọma nʼaka ndị mmadụ. Onyenwe anyị na-atụkwasịkwara ha ndị a na-azọpụta kwa ụbọchị.
ACT 3:1 Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere nʼoge ekpere nʼelekere atọ nke ehihie.
ACT 3:2 Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma.
ACT 3:3 Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ.
ACT 3:4 Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.”
ACT 3:5 O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye.
ACT 3:6 Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.”
ACT 3:7 O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike.
ACT 3:8 Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke.
ACT 3:9 Mmadụ niile hụrụ ya ka ọ na-agagharị na-eto Chineke,
ACT 3:10 ha ghọtara na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-anọ nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ, nke a na-akpọ ọnụ ụzọ ama ọma na-arịọ arịrịọ. Ọ gbagwojuru ha anya nke ukwuu, gbakwa ha gharịị ihe mere ya.
ACT 3:11 Ma dị ka o jidere Pita na Jọn aka, ndị mmadụ niile jiri mgbagwoju anya gbara ọsọ bịakwute ha nʼakụkụ ụlọnsọ ahụ ebe a na-akpọ mgbe ụlọ Solomọn.
ACT 3:12 Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara igwe mmadụ ahụ, “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a ji eju unu anya? Gịnị mere unu ji ele anyị anya dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị maọbụ nʼịdị nsọ anyị ka anyị jiri mee ka nwoke a gawa ije?
ACT 3:13 Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb, Chineke nke nna anyị ha, ebuliela onye na-ejere ya ozi, bụ Jisọs elu, onye unu nyefere ka e gbuo, ma gọnarịkwa ya nʼihu Pailet, nʼagbanyeghị na o kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa.
ACT 3:14 Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ.
ACT 3:15 Unu gburu onye ahụ na-enye ndụ, ma Chineke akpọlitela ya site nʼọnwụ. Anyị bụ ndị akaebe ihe ndị a.
ACT 3:16 Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile.
ACT 3:17 “Ugbu a ụmụnna m, amaara m na unu kpara agwa na-amaghị ama, dịka ndị ndu unu sikwara kpaa.
ACT 3:18 Ma Chineke siri otu a mezuo ihe o kwuru site nʼọnụ ndị amụma niile na Kraịst ya aghaghị ịhụ ahụhụ.
ACT 3:19 Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu,
ACT 3:20 ka enyekwa unu ntute nke ime mmụọ nke sitere nʼihu Onyenwe anyị, ma zitekwara unu Kraịst ahụ, bụ onye ahọpụtara nye unu, nke bụ Jisọs.
ACT 3:21 Onye eluigwe na-aghaghị ịnabata tutu ruo oge ahụ Chineke ga-eweghachi ihe niile nʼọnọdụ ha, dịka o kwere na nkwa nʼogologo oge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ.
ACT 3:22 Mosis sịrị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke ga-eme ka onye amụma ga-adị ka m biliere unu site nʼetiti ụmụ nne unu, unu aghaghị ige ntị nʼihe niile ọ ga-agwa unu.
ACT 3:23 Onye ọbụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị, ka a ga-ekewapụ kpamkpam site nʼetiti ndị ya ma bibiekwa ya.’
ACT 3:24 “Nʼezie ndị amụma niile site na Samuel na ndị ọzọ so ya nʼazụ, bukwara amụma banyere ụbọchị ndị a.
ACT 3:25 Ma unu bụ ndị nketa nke ndị amụma, nakwa nke ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na nna nna unu gbara, mgbe ọ gwara Ebraham, ‘Site na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi mba niile nke ụwa.’
ACT 3:26 Mgbe Chineke kpọlitere onyeozi ya, o buuru ụzọ zitere unu ya, ka ọ gọzie unu site nʼime ka onye ọbụla nʼime unu chegharịa site nʼụzọ ọjọọ ya.”
ACT 4:1 Mgbe ha nọ na-agwa ndị mmadụ ahụ okwu, ndị nchụaja na onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu ahụ na ndị Sadusii bịakwutere ha.
ACT 4:2 Ha were oke iwe nʼihi na ha na-ezi ndị mmadụ ihe, na-ekwusakwa na nʼime Jisọs ka mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dị.
ACT 4:3 Ha jidere ha tinye ha nʼụlọ mkpọrọ, ruo nʼechi ya. Nʼihi na oge e jidere ha bụ nʼoge uhuruchi.
ACT 4:4 Ma ọtụtụ ndị nụrụ okwu ahụ kwenyere. Ọnụọgụgụ ha ruru ihe dị ka puku mmadụ ise.
ACT 4:5 Nʼechi ya, ndị na-achị achị, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ na Jerusalem.
ACT 4:6 Onyeisi nchụaja bụ Anas nọ nʼebe ahụ, na Kaịfas na Jọn na Alegzanda, na ndị ọzọ bụ ndị ikwu onyeisi nchụaja.
ACT 4:7 Mgbe ha kpọpụtara ha nʼetiti ha, ha jụrụ ha, “Ọ bụ site nʼike onye, na site nʼaha onye, ka unu ji mee ihe a?”
ACT 4:8 Nʼoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha, “Unu ndị na-achị ala anyị, na ndị okenye.
ACT 4:9 Ọ bụrụ na unu kpọpụtara anyị ịchọpụta otu nwoke ngwụrọ a si bụrụ onye ahụ dị mma maọbụ otu e si gwọọ ya,
ACT 4:10 ya mere maranụ nke a, unu na ndị Izrel niile, a gwọrọ nwoke a guzo nʼetiti unu site nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret, onye unu kpọgidere nʼobe, ma Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ.
ACT 4:11 Jisọs a bụ “ ‘nkume ahụ unu ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.’
ACT 4:12 Nzọpụta adịghị nʼime onye ọbụla ọzọ, nʼihi na o nweghị aha ọzọ e nyere nʼetiti mmadụ nʼokpuru eluigwe nke e nwere ike isite na ya zọpụta anyị.”
ACT 4:13 Mgbe ha hụrụ nkwuwa okwu Pita na Jọn, na-atụghị ụjọ, ma chọpụtakwa na ha bụ ndị mmadụ nkịtị, na ndị a na-azụghị nʼụlọ akwụkwọ, o juru ha anya. Ma ha ghọtara na ha bụ ndị ha na Jisọs nọkọrọ.
ACT 4:14 Ma mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nʼakụkụ ha, ha enweghị okwu ọbụla ha nwere ikwu megide nke a.
ACT 4:15 Ha nyere iwu ka ha si nʼụlọikpe ahụ pụọ, ma bido ịgba izu nʼetiti onwe ha banyere nke a.
ACT 4:16 Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a? Anyị apụghị ịgọ agọ na ha rụrụ ọrụ ịrịbama pụrụ iche. Ndị niile bi na Jerusalem maara ihe banyere nke a.
ACT 4:17 Ma iji mee ka akụkọ ọrụ ebube a hapụ ịgbasa ruo ọtụtụ mmadụ ntị, ka anyị dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọbụla okwu banyere aha nwoke a.”
ACT 4:18 Ha kpọrọ ha nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu maọbụ izi ihe nʼaha Jisọs.
ACT 4:19 Ma Pita na Jọn zara sị ha, “Kpeenụ ikpe a nʼonwe unu, maọbụ ihe ziri ezi nʼanya Chineke ige unu ntị karịa ige Chineke ntị?
ACT 4:20 Nʼihi na ọ bụ ihe rara ahụ na anyị ga-akwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.”
ACT 4:21 Mgbe ha batụchara ha mba, ha hapụrụ ha ka ha laa. O nweghị ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ nʼihi na mmadụ niile nọ na-eto Chineke nʼihi ihe a mere.
ACT 4:22 Nʼihi na nwoke a gwọrọ nʼụzọ dị ebube agafeela iri afọ anọ.
ACT 4:23 Mgbe ha hapụrụ ha, ha lara kọọrọ ndị ibe ha ihe ndịisi nchụaja na ndị okenye gwara ha.
ACT 4:24 Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile ji otu obi welie olu ha kpọkuo Chineke, sị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gị onwe gị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha.
ACT 4:25 Ọ bụ gị sitere nʼaka Mmụọ Nsọ site nʼọnụ nna anyị Devid, onye na-ejere gị ozi, sị: “ ‘Gịnị mere mba niile ji eme oke mkpọtụ? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?
ACT 4:26 Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa, imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.’
ACT 4:27 Nʼezie nʼobodo a, Herọd na Pọntiọs Pailet, na ndị mba ọzọ, nakwa ndị Izrel ezukọtala imegide onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ Jisọs, onye i tere mmanụ,
ACT 4:28 ha mere ihe i jiri ike gị na uche gị kwuo na ha aghaghị imezu.
ACT 4:29 Ugbu a, Onyenwe anyị, lee ịba mba ha ma nye ndị ohu gị ike iji gbasaa ozi gị na-atụghị egwu ọbụla.
ACT 4:30 Setịpụ aka gị gwọọ ndị ọrịa ma rụọ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama site nʼaha onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi bụ Jisọs.”
ACT 4:31 Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.
ACT 4:32 Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere.
ACT 4:33 Ndị ozi sitere nʼike gaa nʼihu na-agba ama banyere mbilite nʼọnwụ Onyenwe anyị Jisọs, oke amara bakwaara ha niile ụba.
ACT 4:34 O nweghị onye mkpa kpara nʼime ha, nʼihi na site nʼoge ruo nʼoge, ndị nwere ala maọbụ ụlọ na-ere ha, ma wetakwa ego ha retara na ha,
ACT 4:35 nye ndị ozi, a na-ekekwa ya nye onye ọbụla dị ka mkpa ya si dị.
ACT 4:36 Josef onye ikwu Livayị, onye sitere na Saiprọs, onye ndị ozi na-akpọ Banabas (nke pụtara “nwa nke nkasiobi”).
ACT 4:37 O rere ala o nwere, weta ego ya, ma tọgbọ ya nʼụkwụ ndị ozi.
ACT 5:1 Ma otu nwoke a na-akpọ Ananayas na nwunye ya bụ Safaịra rekwara ala nke ha.
ACT 5:2 Na nkwekọrịta ya na nwunye ya, o zoro ụfọdụ ego site nʼego ha retara nʼala ha ahụ, weta nke fọdụrụ bịa tọgbọ nʼụkwụ ndị ozi.
ACT 5:3 Pita sịrị, “Ananayas, gịnị mere ekwensu jiri jupụta obi gị mee ka ị ghaara mmụọ nsọ ụgha mgbe i zopuuru onwe gị ego site nʼime ego i retara nʼala gị?
ACT 5:4 Ọ bụghị gị nwe ala ahụ tupu e ree ya? Mgbe e rechara ya, ego e retara ya ọ bụghị nke gị, iji mee ka ị chọrọ? Gịnị mere i ji chee echiche ime ihe dị otu a? Ọ bụghị mmadụ ka ị ghaara ụgha kama ọ bụ Chineke.”
ACT 5:5 Mgbe Ananayas nụrụ okwu ndị a, ọ dara nʼala nwụọ, egwu jidekwara ndị niile nụrụ ihe mere.
ACT 5:6 Ụmụ okorobịa ndị nọ ebe ahụ batara jiri akwa kee ozu ya bupụ ya ga lie.
ACT 5:7 Mgbe ihe dịka awa atọ gasịrị, nwunye ya batakwara, ma ọ matabeghị ihe mere di ya.
ACT 5:8 Pita jụrụ ya, gwa m, “ọ bụ ego ole a ka gị na di gị retara ala ahụ?” Ọ sịrị, “E, ọ bụ ego ole ahụ ka anyị retara ya.”
ACT 5:9 Pita sịrị ya, “Gịnị mere unu jiri kpebie ịnwa Mmụọ nke Onyenwe anyị ọnwụnwa? Gee ntị, nzọ ụkwụ ndị buuru di gị gaa lie nọ nʼọnụ ụzọ. Ha ga-ebupụkwa gị.”
ACT 5:10 Nʼotu oge ahụ ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, nwụọ, ụmụ okorobịa ahụ liri di ya batakwara chọpụta na ọ nwụọla, buru ya pụọ gaa lie ya nʼakụkụ di ya.
ACT 5:11 Oke egwu tụrụ nzukọ ahụ niile, tụọkwa ndị niile nụrụ akụkọ banyere ihe ndị a.
ACT 5:12 Ndị ozi ahụ rụkwara ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ. Ha niile na-ezukọ na mgbe ụlọ Solomọn.
ACT 5:13 O nweghị onye ọbụla kwere iso ha ọzọ, nʼagbanyeghị na ọtụtụ mmadụ na-asọpụrụ ha.
ACT 5:14 Ma otu ọ dị, ọtụtụ ndị nwoke na ndị nwanyị kwere nʼOnyenwe anyị sonyere ha.
ACT 5:15 Nʼihi nke a, ndị mmadụ bupụtara ndị ọrịa nʼokporoụzọ nibe ha nʼute na ihe ndina, ka ọ ga-abụ mgbe Pita na-agafe onyinyo ya ga-adakwasị ụfọdụ nʼime ha.
ACT 5:16 Igwe mmadụ zukọtara site nʼobodo ndị dị Jerusalem gburugburu. Ha butekwara ndị nrịa nrịa, na ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-enye nsogbu, a gwọkwara ha niile.
ACT 5:17 Mgbe ahụ onyeisi nchụaja na ndị otu ya so nʼotu ndị Sadusii ka ekworo jupụtara obi.
ACT 5:18 Ha jidere ndị ozi a tụba ha nʼụlọ mkpọrọ nke ọha mmadụ.
ACT 5:19 Ma nʼoge abalị mmụọ ozi Onyenwe anyị meghere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ kpọpụta ha sị,
ACT 5:20 “Gaanụ, guzoronụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ gwa ndị mmadụ ozi niile nke ndụ ọhụrụ a.”
ACT 5:21 Mgbe ha nụrụ nke a, nʼisi ụtụtụ, ha banyere nʼụlọnsọ ukwu malite izi ihe. Ma mgbe onyeisi nchụaja na ndị soo ya bịarutere, ha kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin nke bụ ọgbakọ jikọtara ndị okenye Izrel niile. Ha zipụrụ ozi ka e site nʼụlọ mkpọrọ kpụta ha.
ACT 5:22 Ma mgbe ndị ahụ ha zipụrụ ruru nʼụlọ mkpọrọ, ha ahụghị ndị ozi ahụ. Ha lọghachiri azụ kọọrọ ndị ọgbakọ ahụ ihe ha hụrụ,
ACT 5:23 “Anyị hụrụ ka a kpọchiziri ụlọ mkpọrọ ahụ nke ọma, ndị nche guzokwa nʼọnụ ụzọ ya. Ma mgbe anyị meghere ụlọ mkpọrọ ahụ, anyị ahụghị onye ọbụla nʼime ya.”
ACT 5:24 Mgbe onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu na ndịisi nchụaja nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharịị, ha na-eche ihe nke a ga-apụta.
ACT 5:25 Nʼotu oge ahụ, otu onye gbabatara gwa ha, “Leenụ! Ndị ahụ unu tụbara nʼụlọ mkpọrọ guzo ugbu a nʼime ụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe.”
ACT 5:26 Ngwangwa, onyeisi agha na ndị agha ya gara nʼụlọnsọ ahụ jide ndị ozi ahụ ma kpụta ha, ma ha ejighị ike mee nke a nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume.
ACT 5:27 Mgbe a kpụtara ha, e mere ka ha guzoro nʼihu ọgbakọ ndị Sanhedrin, onyeisi nchụaja jụrụ ha ajụjụ,
ACT 5:28 sị, “Ọ bụ anyị adọghị unu aka na ntị ka unu kwụsị ikuzi ihe nʼaha a; ma unu emeela ka ozizi unu jupụta Jerusalem niile kpebiekwa ime ka ọbara nwoke a dịrị anyị nʼisi.”
ACT 5:29 Pita na ndị ozi ndị ọzọ zara sị, “Anyị ga-erubere Chineke isi ọ bụghị mmadụ.
ACT 5:30 Chineke nna nna anyị a kpọlitela Jisọs site nʼọnwụ bụ onye ahụ unu gburu site nʼịkpọgide ya nʼelu osisi.
ACT 5:31 Chineke ebuliela ya elu nʼaka nri nke ya onwe ya dị ka Ọkpara eze na Onye nzọpụta, ka o nwee ike inye ndị Izrel niile nchegharị na mgbaghara mmehie.
ACT 5:32 Anyị bụ ndị ama nke ihe ndị a, Mmụọ Nsọ onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi bụkwa onyeama.”
ACT 5:33 Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbawara ha obi, ha chọọ igbu ha.
ACT 5:34 Ma otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, bụrụkwa onye ozizi iwu a na-asọpụrụ, aha ya bụ Gamaliel, biliri ọtọ nʼetiti ọgbakọ ahụ, nye iwu ka a kpọpụ ndị ozi ahụ nʼezi nwa oge nta.
ACT 5:35 Ọ sịrị ha, “Ndị Izrel, leziekwanụ anya nke ọma ihe unu na-achọ ime ndị a.
ACT 5:36 Nʼoge gara aga Teodas pụtara na-egosi na ya bụ onye pụrụ iche, ihe dịka narị mmadụ anọ sokwara ya, mgbe e gburu ya, ndị niile sooro ya gbasasịrị ihe niile a kwụsịkwa.
ACT 5:37 Mgbe nke ya gasịrị, Judas onye Galili pụtakwara gosi onwe ya nʼoge a na-agụ ọnụọgụgụ mmadụ, o nwetakwara ndị sooro ya. Mgbe e gbukwara ya, ndị niile na-eso ya gbasasịrị.
ACT 5:38 Ya mere, agwa m unu, hapụnụ ndị a ka ha laara onwe ha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ha bụ ọrụ mmadụ, ọ ga-akwụsị mgbe na-adịghị anya.
ACT 5:39 Ma ọ bụrụ na o sitere nʼaka Chineke, unu agaghị enwe ike ịkwụsị ndị ikom ndị a, unu ga-achọpụta naanị na unu na-alụso Chineke ọgụ.”
ACT 5:40 Ọgbakọ ahụ nabatara ndụmọdụ ya. Ha kpọrọ ndị ozi ahụ pịa ha ihe, nyekwa ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu nʼaha Jisọs, hapụkwa ha ka ha laa.
ACT 5:41 Mgbe ha hapụrụ ọgbakọ ahụ, ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na-agụnyere ha na ndị kwesiri ịnara mkparị nʼihi aha ya.
ACT 5:42 Ụbọchị niile, nʼime ụlọnsọ ukwu ma nʼụlọ ndị mmadụ ha na-akụzi ma na-ekwusa oziọma na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
ACT 6:1 Nʼoge ahụ mgbe ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya bidoro ịmụba, ndị Juu na-asụ asụsụ Griik mere mkpesa megide ndị Juu na-asụ asụsụ Hibru nʼihi na a na-elefuru ndị inyom ha, ndị di ha nwụrụ anwụ anya na nri a na-eke kwa ụbọchị.
ACT 6:2 Nʼihi nke a, ndị ozi iri na abụọ ahụ kpọrọ ọgbakọ ndị niile na-eso ụzọ ya sị, “O zighị ezi na anyị ga-ahapụ ikwusa oziọma Chineke bido na-eke nri.
ACT 6:3 Ụmụnna anyị, sitenụ nʼetiti unu họpụta ndị ikom asaa ndị a na-agbara ezi ama na ha jupụtara na Mmụọ Nsọ na amamihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nʼaka.
ACT 6:4 Ebe anyị onwe anyị, ga-enyefe onwe anyị nʼọrụ ikpe ekpere, na ọrụ niile metụtara izisa oziọma.”
ACT 6:5 Mmadụ niile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke jupụtara nʼokwukwe na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, Prokorọs, Nikanọ, Timọn, Pamenas na Nikolas, onye Antiọk na-eso ụzọ ofufe ndị Juu.
ACT 6:6 Ha chere mmadụ ndị a nʼihu ndị ozi, ndị kpeere ha ekpere, bikwasịkwa ha aka nʼisi.
ACT 6:7 Okwu Chineke gbasara nnọọ. Ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya na Jerusalem bakwara ụba. Nʼoge a, ọtụtụ ndị nchụaja nabatara na-erubekwa isi nʼokwukwe.
ACT 6:8 Ugbu a, Stivin, nwoke jupụtara nʼamara na nʼike Chineke rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ.
ACT 6:9 Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu si nʼụlọ nzukọ nke ndị nweere onwe ha (dị ka e si akpọ ya), na nke ndị Sirini na Alegzandria nakwa ndị ọzọ sitere na mpaghara Silisia na Eshịa. Ha na Stivin malitere ịrụgharị ụka.
ACT 6:10 Ma ha enweghị ike iguzogide amamihe na ike nke Mmụọ Nsọ nke o ji ekwu okwu.
ACT 6:11 Mgbe ahụ, ha ji ụzọ nzuzo kpalie ụfọdụ ndị ikom ka ha sị, “Anyị nụrụ ka ọ na-ekwujọ Mosis na Chineke.”
ACT 6:12 Ha kpasuru ndị mmadụ, ma ndị okenye ma ndị ozizi iwu. Ha bịakwutere ya jide ya, kpụrụ ya gaa na nnọkọ ụlọ ikpe.
ACT 6:13 Ha kpọtakwara ndị bịara gbaa ama ụgha megide ya sị, “Oge niile ka nwoke a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ebe a dị nsọ na iwu anyị.
ACT 6:14 Anyị nụrụ ka o kwuru, na Jisọs onye Nazaret a ga-akwatu ụlọ a, gbanwekwa omenaala Mosis nyere anyị.”
ACT 6:15 Ndị niile nọ nʼụlọikpe ahụ legidere ya anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwu dị ka ihu mmụọ ozi.
ACT 7:1 Onyeisi nchụaja sịrị ya, “Ị nụrụ ihe ndị a, ọ bụ eziokwu?”
ACT 7:2 Ọ sịrị, “Ụmụnna m na ndị nna, geenụ m ntị. Chineke onye dị ebube gosiri nna nna anyị Ebraham onwe ya mgbe ọ nọ na Mesopotamịa, tupu ọ gaa biri na Haran.
ACT 7:3 Ọ gwara ya, ‘Site nʼobodo gị na nʼetiti ndị ikwu gị pụọ, gaa nʼala m ga-egosi gị.’
ACT 7:4 “Ya mere, o sitere nʼobodo ndị Kaldịa pụọ, gaa biri na Haran. Mgbe nna ya nwụrụ, Chineke zitere ya nʼala a ebe unu bi ugbu a.
ACT 7:5 O nyeghị ya ihe nketa nʼebe a, ọ bụladị ihe ruru otu nzọ ụkwụ. Ma o kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ka ọ bụrụ nke ha, nʼagbanyeghị na ọ mụtaghị nwa.
ACT 7:6 Ma Chineke gwara ya otu a, na, ‘Ụmụ ụmụ ya ga-ebi dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha, ndị ga-eji ha mere ohu, ma mejọọkwa ha narị afọ anọ.
ACT 7:7 Mana aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ.’ Chineke kwukwara sị, ‘Mgbe nke a gasịrị, ha ga-esi na mba ahụ pụta, bịa fee m ofufe nʼebe a.’
ACT 7:8 O nyere ya ọgbụgba ndụ nke obibi ugwu. Ebraham mụrụ Aịzik bie ya ugwu nʼụbọchị nke asatọ. Aịzik amụta Jekọb, Jekọb amụta ndịisi ebo iri na abụọ nke Izrel.
ACT 7:9 “Nʼihi na ndị nna ochie ahụ nwere ekworo nʼebe Josef nọ. Ha resi ya ndị Ijipt dịka ohu. Ma Chineke nọnyeere ya,
ACT 7:10 zọpụta ya na mkpagbu ya niile, mee ka o nwee ihuọma na amamihe nʼihu Fero eze Ijipt. Onye mere ya onye ọchịchị nʼala Ijipt na onye nlekọta nke ezinaụlọ ya niile.
ACT 7:11 “Nʼoge ahụ, ụnwụ dara nʼala Ijipt na nʼala Kenan. Ụnwụ a wetara ahụhụ dị ukwuu. Nna nna anyị ha enwekwaghị ike ịchọta nri.
ACT 7:12 Ma mgbe Jekọb nụrụ na nri ọka dị nʼala Ijipt, o zipụrụ nna nna anyị ha ka ha gaa njem mbụ ha nʼIjipt. Nke a bụ oge nke mbụ ha na-aga Ijipt.
ACT 7:13 Mgbe ha gara Ijipt nke ugboro abụọ, Josef mere ka ụmụnne ya mata ya, Fero matakwara ụmụnne Josef.
ACT 7:14 Mgbe ahụ, Josef ziri ozi ka a kpọta nna ya bụ Jekọb na ndị ikwu ya, ndị dị iri mmadụ asaa na ise ka ha bịakwute ya.
ACT 7:15 Jekọb gara Ijipt. Ebe ahụ ka ya na nna nna anyị ha nọkwa nwụọ.
ACT 7:16 E budatara ozu ha na Shekem, ebe e liri ha nʼili nke Ebraham jiri ego ọlaọcha zụta nʼaka ụmụ Hamọ nʼala Shekem.
ACT 7:17 “Ma mgbe oge ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa na-abịaru nso, ndị Izrel nọ nʼIjipt mụbara nke ukwuu,
ACT 7:18 ruo mgbe eze ọzọ nke na-amaghị Josef, bidoro ịchị ọchịchị nʼala Ijipt.
ACT 7:19 O megburu ndị agbụrụ anyị, kpagbukwaa ha. Manye ndị nna nna anyị ha ka ha tufuo ụmụ ọhụrụ ha, ka ha ghara ịdị ndụ.
ACT 7:20 “Ọ bụ nʼoge a ka a mụrụ Mosis, ọ mara mma nke ukwuu nʼanya Chineke. A zụrụ ya naanị ọnwa atọ nʼụlọ nna ya.
ACT 7:21 Mgbe e tufuru ya, ada Fero kpọọrọ ya, zụọ ya dị ka nwa nwoke nke aka ya.
ACT 7:22 A zụrụ Mosis nʼamamihe niile nke ndị Ijipt, ọ bụrụ dike nʼokwu na nʼọrụ ịtụnanya.
ACT 7:23 “Mgbe ọ gbara iri afọ anọ, ọ batara ya nʼuche ịga ileta ụmụnna ya ndị Izrel.
ACT 7:24 Mgbe ọ hụrụ otu onye nʼime ha nke onye Ijipt na-emegide ya, ọ lụtara ya ọgụ, bọtakwara ya ọbọ site nʼigbu onye Ijipt ahụ.
ACT 7:25 Mosis chere na ụmụnna ya ga-aghọta na Chineke akpọlitela ya isite nʼaka ya napụta ha. Ma ha aghọtaghị.
ACT 7:26 Nʼụbọchị ọzọ sonụ, Mosis hụrụ ụmụnna ya ndị Izrel abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Ọ gbalịrị ime ka udo dịrị nʼetiti ha, sị, ‘Unu bụ ụmụnna, gịnị mere unu ji emejọrịta onwe unu?’
ACT 7:27 “Ma nwoke ahụ nke na-emegbu nwanna ya nupuru ya sị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị?
ACT 7:28 Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ụnyaahụ?’
ACT 7:29 Mgbe ọ nụrụ nke a, Mosis gbara ọsọ, gaa biri dị ka ọbịa nʼala Midia. Nʼebe ahụ ka ọ nọ mụta ụmụ nwoke abụọ.
ACT 7:30 “Mgbe iri afọ anọ gafere, e mere ka Mosis hụ mmụọ ozi nʼọkụ na-ere ọhịa dị nʼọzara, nʼakụkụ Ugwu Saịnaị.
ACT 7:31 Ma mgbe ọ hụrụ nke a, o juru ya anya. Dị ka ọ na-agaru nso ka o leruo ya anya, ọ nụrụ olu Onyenwe anyị ka ọ dara, sị,
ACT 7:32 ‘Abụ m Chineke nna nna gị ha. Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb.’ Ụjọ mere ka Mosis maa jijiji, na o nweghị ike ilegide ya anya.
ACT 7:33 “Ma Onyenwe anyị gwara ya, ‘Yipụ akpụkpọụkwụ gị. Nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.
ACT 7:34 Ahụla m otu e si akpagbu ndị m nọ nʼala Ijipt. Anụla m ịsụ ude ha bịakwa ịzọpụta ha. Ugbu a bịa, aga m ezighachi gị nʼIjipt.’
ACT 7:35 “Ọ bụ otu Mosis ahụ ha jụrụ ajụ, mgbe ha sịrị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe?’ Ọ bụkwa ya ka Chineke zigara ị bụ onyeisi na onye nnapụta ha, site nʼinyeaka mmụọ ozi ahụ mere ka ọ hụ ya nʼọhịa ahụ.
ACT 7:36 O duuru ha pụta mgbe ọ rụsịrị ọrụ ebube na ihe ịrịbama dị iche iche nʼala Ijipt, na nʼOsimiri Uhie na nʼọzara iri afọ anọ.
ACT 7:37 “Onye a bụ Mosis ahụ gwara ụmụ Izrel, sị, ‘Chineke ga-eme ka onye amụma nke dị ka m, biliere unu site nʼetiti ụmụnne unu.’
ACT 7:38 Ya onwe ya nọ nʼọgbakọ nʼọzara, ya na mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu nʼUgwu Saịnaị, na nna nna anyị ha; ebe ọ natakwara okwu dị ndụ inye anyị.
ACT 7:39 “Ma nna nna anyị ha jụrụ irubere ya isi. Kama ha nupuru ya nʼakụkụ, ma tụgharịa laghachi azụ nʼIjipt nʼobi ha,
ACT 7:40 na-asị Erọn, ‘Meere anyị chi, ndị nke ga-edu anyị, nʼihi na anyị amaghị ihe mere nwoke a bụ Mosis, onye sitere nʼala Ijipt dupụta anyị.’
ACT 7:41 Ha kpụụrụ onwe ha arụsị nke oyiyi nwa ehi, ha butere ihe ịchụ aja nye ya. Ha ṅụrịrị ọṅụ nʼọrụ nke aka ha.
ACT 7:42 Ma Chineke chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ. Ọ rara ha nye ikpere usuu ihe dị nʼeluigwe. Nke a dabara nʼihe e dere nʼakwụkwọ ndị amụma, “ ‘Unu ụlọ Izrel, unu o wetara m onyinye anụ e gburu egbu ka ọ dị aja unu chụụrụ m iri afọ anọ unu nọrọ nʼọzara?
ACT 7:43 Unu buliri ụlọ ikwu nke Mọlọk na kpakpando nke chi unu bụ Refan, bụ arụsị ndị ahụ unu mere ịkpọ isiala nye ha. Ya mere, aga m ewezuga unu, burukwa unu gaa nʼofe obodo Babilọn.’
ACT 7:44 “Ndị nna nna anyị ha nwere ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ nʼọzara. E mere ya site na ntụziaka na usoro ihe atụ Chineke gosiri Mosis.
ACT 7:45 Mgbe Joshua duuru nna nna anyị ha nweta ala ndị mba ọzọ ndị Chineke chụpụrụ. E butekwara igbe ọgbụgba ndụ a nʼala ahụ. Ọ nọgidekwara nʼala ahụ tutu ruo nʼoge Devid.
ACT 7:46 Onye chọtara ihuọma nʼebe Chineke nọ, ma rịọ ka o wuore Chineke nke Jekọb ebe obibi.
ACT 7:47 Ma ọ bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ.
ACT 7:48 “Otu ọ dị, Onye kachasị ihe niile elu adịghị ebi nʼụlọ e ji aka wuo, dịka onye amụma kwuru,
ACT 7:49 “ ‘Eluigwe bụ ocheeze m. Ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewuru m? Maọbụ ebee ka ebe izuike m ga-adị? Ka Onyenwe anyị kwuru.
ACT 7:50 Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile?’
ACT 7:51 “Unu ndị isiike! Ndị obi ha, na ntị ha kpọchiri akpọchi ịnụ ihe. Ndị na-ajụ ịnabata Mmụọ Nsọ dịka nna nna unu ha mere.
ACT 7:52 Ọ dị onye amụma ndị nna unu ha na-akpọgbughị? Ha gburu ọ bụladị ndị buru amụma banyere ọbịbịa nke onye ezi omume ahụ, ma ugbu a unu bụ ndị raara ya nye ma gbukwaa ya.
ACT 7:53 Unu bụ ndị natara iwu Chineke dịka e nyere ya site nʼaka ndị mmụọ ozi, ma unu edebeghị ya.”
ACT 7:54 Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, iwe were ha nke ukwu. Ha tara ikikere eze nʼiwe na nʼọnụma nʼebe ọ nọ.
ACT 7:55 Ma ebe o jupụtara na Mmụọ Nsọ, o lere anya nʼeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nʼaka nri Chineke.
ACT 7:56 Ọ sịrị, “Lee, ana m ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-eguzo nʼaka nri Chineke.”
ACT 7:57 Ha mere ụzụ dị ukwuu, were mkpịsịaka ha rụchie ntị ha. Ha niile gbara ọsọ gaa nụkwasị ya,
ACT 7:58 dọkpụrụ ya pụọ nʼazụ obodo malite ịtụ ya nkume. Nʼoge a, ndị akaebe wụsara uwe ha nʼụkwụ otu nwokorobịa a na-akpọ Sọl.
ACT 7:59 Mgbe ha na-atụ Stivin nkume ahụ, o kpere ekpere, “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m.”
ACT 7:60 O gburu ikpere nʼala werekwa oke olu tie mkpu, “Onyenwe anyị, biko agụnyekwarala ha mmehie nke a!” Mgbe o kwusiri nke a, ọ dara nʼala nwụọ.
ACT 8:1 Sọl kwenyere ka e gbuo ya. Nʼụbọchị ahụ, oke mkpagbu bidoro megide nzukọ dị na Jerusalem. Ndị niile kwere ekwe, ma ewezuga ndị ozi nʼonwe ha gbasasịrị nʼala Judịa na Sameria.
ACT 8:2 Ndị ikom, ndị na-atụ egwu Chineke, bịara buru ozu Stivin gaa lie ya. Ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ya.
ACT 8:3 Ma Sọl bidoro ịla nzukọ nʼiyi. Ọ na-abanye site nʼụlọ ga nʼụlọ ndị kwere ekwe na-adọpụta ha, nwoke na nwanyị, tinye ha nʼụlọ mkpọrọ.
ACT 8:4 Ndị ahụ a chụsasịrị zisara oziọma nʼebe niile ha gbagara.
ACT 8:5 Filip gara nʼotu obodo dị na Sameria kwusaara ndị nọ nʼebe ahụ ihe banyere Kraịst.
ACT 8:6 Igwe mmadụ gere ntị nʼihe Filip na-ekwu nʼihi na ha hụrụ ọrụ ịrịbama ọ rụrụ.
ACT 8:7 Mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha ji iti mkpu site nʼime ọtụtụ mmadụ pụta. Ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ na ndị ngwụrọ.
ACT 8:8 Nʼihi ya, ọṅụ dị ukwuu jupụtara nʼobodo ahụ.
ACT 8:9 Ugbu a, kemgbe ọtụtụ oge gara aga, otu nwoke aha ya bụ Saimọn bụ onye mgbaasị. O jirila mgbaasị ya mee ọtụtụ ihe tụrụ ndị niile bi nʼobodo Sameria nʼanya. Ọ na-anyakwa isi na ya bụ onye dị ukwu.
ACT 8:10 Onye ọbụla, ma onye ukwu ma onye nta, na-ege ya ntị na-asịkwa “Nwoke a bụ ike Chineke ahụ a na-akpọ Ike dị ukwuu.”
ACT 8:11 Ha na-ege ya ntị oge niile nʼihi na ọ na-eji ike mgbaasị ya na-eme ihe juru ha anya.
ACT 8:12 Ma mgbe ha kwenyere nʼoziọma Filip dịka ọ na-ekwusa ihe banyere oziọma alaeze Chineke na aha Jisọs Kraịst, e mere ha baptizim, ma nwoke ma nwanyị ha.
ACT 8:13 Saimọn kwerekwara otu aka ahụ. Mgbe e mechara ya baptizim, o bidoro iso Filip na-agagharị nʼihi ihe ịrịbama na ọrụ ebube niile Filip rụrụ, tụrụ ya nʼanya nke ukwuu.
ACT 8:14 Mgbe ndị ozi nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala okwu nke Chineke, ha zigaara ha Pita na Jọn.
ACT 8:15 Mgbe ha bịaruru, ha kpere ekpere ka ha nata Mmụọ Nsọ.
ACT 8:16 Nʼihi na Mmụọ Nsọ abịakwasịbeghị onye ọbụla nʼime ha, kama ihe e mere ha bụ baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs.
ACT 8:17 Mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ha aka nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ.
ACT 8:18 Mgbe Saimọn hụrụ na a na-enye Mmụọ Nsọ naanị site nʼaka ndị ozi bikwasịrị ha nʼisi, o chere ha ego nʼihu,
ACT 8:19 sị, “nyekwanụ m ike a. Ka onye ọbụla m bikwasịrị aka nʼisi nata Mmụọ Nsọ.”
ACT 8:20 Ma Pita sịrị, “Gị na ego gị laakwa nʼiyi. Nʼihi na i chere na ị ga-eji ego zụta onyinye Chineke.
ACT 8:21 I nweghị oke maọbụ ihe nketa nʼọrụ a, nʼihi na obi gị ezighị ezi nʼihu Chineke.
ACT 8:22 Si nʼajọ omume gị chegharịa, rịọ Onyenwe anyị arịrịọ ma eleghị anya ọ ga-agbaghara gị echiche ọjọọ niile nke obi gị.
ACT 8:23 Nʼihi na ahụrụ m na ị jupụtara nʼobi ilu na ị nọkwa nʼagbụ nke ajọ omume.”
ACT 8:24 Saimọn zara Pita sị, “Biko, kpee ekpere rịọrọ m Chineke, ka ihe ndị a niile i kwuru, hapụ ịbịakwasị m.”
ACT 8:25 Mgbe ha gbachara akaebe, ma kwusaakwa okwu nke Onyenwe anyị, ha lọghachiri Jerusalem. Ma mgbe ha na-ala ha zisara oziọma nʼọtụtụ obodo ndị Sameria.
ACT 8:26 Mgbe ahụ mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Filip sị, “Gaa na ndịda, nʼụzọ ọzara nke siri Jerusalem gawa Gaza, ụzọ ahụ bụ ụzọ ọzara.”
ACT 8:27 O biliri gawa. Mgbe ahụ, otu onye Itiopia bụ onye onozi, bụrụkwa onyeisi ozi dị mkpa, onye na-eche akụ nke Kandis, eze nwanyị ndị Itiopia, gara Jerusalem ife Chineke.
ACT 8:28 Mgbe ọ na-ala, ọ nọdụrụ ala nʼụgbọala ya, nke ịnyịnya na-adọkpụgharị, na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma.
ACT 8:29 Mmụọ Nsọ gwara Filip, “Gaa ụgbọ ahụ nso, sonyekwara ya.”
ACT 8:30 Filip gara nso, nụkwa ka ọ na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Ọ sịrị, “Ị na-aghọta ihe ị na-agụ?”
ACT 8:31 Ọ sịrị, “M ga-esi aṅaa ghọta, ma mmadụ ezighị m?” Ọ rịọrọ Filip ka ọ rigota nʼụgbọala ahụ, soro ya nọdụ nʼime ya.
ACT 8:32 Mpaghara akwụkwọ nsọ ọ na-agụ bụ nke a, “E duuru ya dị ka atụrụ gaa nʼebe a ga-egbu ya. Dịka nwa atụrụ na-anọ nwayọọ nʼihu onye na-akpacha ya ajị, otu a ka ọ na-emegheghị ọnụ ya.
ACT 8:33 Nʼọnọdụ ịdị ala ya, e meghị ka ikpe ziri ezi ruo ya aka. Onye ga-akọ akụkọ banyere agbụrụ ya? Nʼihi na e sitere nʼụwa wepụ ndụ ya.”
ACT 8:34 Onozi ahụ jụrụ Filip, “Biko, gwa m, onye ka onye amụma a na-ekwu okwu ya? Ọ bụ ihe banyere onwe ya ka ọ na-ekwu, ka ọ bụ banyere onye ọzọ?”
ACT 8:35 Mgbe ahụ, Filip malitere ikwu okwu, site nʼakụkọ akwụkwọ nsọ ọ na-agụ kọọrọ ya akụkọ oziọma banyere Jisọs.
ACT 8:36 Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ha bịaruru ebe ọdọ mmiri nta dị. Onozi ahụ sịrị, “Lee, nke a bụ mmiri. Ọ dị ihe ga-egbochi ime m baptizim?”
ACT 8:37 Filip sịrị, “Ọ bụrụ na i ji obi gị niile kwere, e nwere ike ime gị baptizim.” Onozi ahụ sịrị, “Ekwere m na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke.”
ACT 8:38 O kwuru ka a kwụsị ụgbọala ahụ. Mgbe ahụ, onozi ahụ na Filip wụdatara banye nʼime mmiri ebe Filip nọ mee ya baptizim.
ACT 8:39 Mgbe ha sitere nʼime mmiri ahụ pụta, ngwangwa Mmụọ Onyenwe anyị sitere nʼebe ahụ wepụ Filip, onye onozi ahụ ahụkwaghị ya anya ọzọ; kama ọ gara nʼihu nʼije ya na-aṅụrịkwa ọṅụ.
ACT 8:40 Ebe ọzọ a hụrụ Filip bụ nʼAzọtus. O jegharịkwara nʼobodo niile dị nʼala ahụ, na-ekwusa oziọma ruo mgbe ọ bịaruru Sizaria.
ACT 9:1 Ma ugbu a, Sọl, onye ume niile ọ na-ekupụta bụ naanị ịba mba na igbu ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị, gakwuuru onyeisi nchụaja,
ACT 9:2 rịọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru ndị ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs, nke ọ ga-abụ ọ hụ onye ọbụla na-eso Ụzọ ahụ ma ha bụ nwoke ma ha bụ nwanyị, ka ọdọkpụrụ ha nʼagbụ, kpụgaa Jerusalem.
ACT 9:3 Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ihe ìhè nke sitere nʼeluigwe chara ya gburugburu.
ACT 9:4 Ọ dara nʼala, nụ olu na-akpọ ya oku, “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?”
ACT 9:5 Ọ sịrị, “Ị bụ onye, Onyenwe anyị?” Olu ahụ zaghachiri, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu.
ACT 9:6 Ugbu a, bilie, baa nʼime obodo, a ga-agwa gị ihe ị na-aghaghị imezu.”
ACT 9:7 Ndị ikom ha na ya so aga guzoro nʼebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọbụla.
ACT 9:8 Sọl si nʼala bilie, ma nʼagbanyeghị nʼanya ya meghere emeghe, ọ dịghị ihe o nwere ike ịhụ. Nke a mere na ha sekpụrụ ya nʼaka dubata ya na Damaskọs.
ACT 9:9 Ọ hụghị ụzọ ụbọchị atọ, o nweghị ike iri nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ.
ACT 9:10 Otu onye nke na-eso ụzọ ya nọ na Damaskọs, a na-akpọ Ananayas. Onyenwe anyị gwara ya nʼọhụ, “Ananayas!” Ọ sịrị, “Lee m, Onyenwe anyị.”
ACT 9:11 Onyenwe anyị gwara ya, “Gaa nʼụlọ Judas nke dị nʼokporoụzọ Guzoziri Eguzo, jụọ ajụjụ banyere onye a na-akpọ Sọl, onye si Tasọs, ọ nọ ugbu a na-ekpe ekpere.
ACT 9:12 Ọ hụla ọhụ na otu nwoke a na-akpọ Ananayas na-abịakwute ya, ibikwasị ya aka nʼisi ka ọ hụ ụzọ.”
ACT 9:13 Ma Ananayas zara, “Onyenwe anyị, anụla m akụkọ ihe ọjọọ niile nwoke a mere ndị nsọ gị bi na Jerusalem.
ACT 9:14 Ugbu a, ọ natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja bịa nʼebe a ka o jide ndị niile na-akpọku aha gị.”
ACT 9:15 Ma Onyenwe anyị gwara ya, “Gaa, nʼihi na ahọpụtala m nwoke a ka ọ bụrụ ngwa ọrụ m, onye ga-ewegara mba ndị ọzọ, ndị eze na ụmụ Izrel aha m.
ACT 9:16 Mụ onwe m ga-egosi ya ụdị ahụhụ ọ na-aghaghị ịta nʼihi aha m.”
ACT 9:17 Ya mere, Ananayas garuru nʼụlọ ahụ, banyekwa nʼime ya. Ọ bikwasịrị aka ya nʼisi Sọl, sị, “Nwanna Sọl, Onyenwe anyị Jisọs, onye gosiri gị onwe ya nʼụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ka ị jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.”
ACT 9:18 Otu mgbe ahụ, ihe dịka akpịrịkpa sitere nʼanya ya dapụta, o bidokwara ịhụ ụzọ ọzọ. O biliri ọtọ, e mee ya baptizim.
ACT 9:19 Mgbe o richara nri, ọ nwetakwara ike ya. Ya na ndị na-eso ụzọ Jisọs nọrọ na Damaskọs ọtụtụ ụbọchị.
ACT 9:20 Ngwangwa, o bidoro ikwusa Jisọs nʼụlọ nzukọ na-asị, Ọ bụ Ọkpara Chineke.
ACT 9:21 O juru ndị niile nụrụ ya anya, ha na asị, “Ọ bụghị nwoke a bụ onye ahụ na-emekpa ndị niile na-akpọku aha ahụ na Jerusalem? Ọ bụ na ọ bụghị maka nke a ka o ji bịa ebe a ịkpụrụkwa ha kpụgara ndịisi nchụaja?”
ACT 9:22 Ma Sọl gara nʼihu baa ụba nʼike karịa na ikwu okwu nke gbara ndị Juu bi nʼobodo Damaskọs gharịị site nʼụzọ o siri gosi na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
ACT 9:23 Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ndị Juu gbara izu igbu ya.
ACT 9:24 Ma Sọl chọpụtara ihe ha zubere ime. Ehihie na abalị, ndị a nọ na-eche ụzọ niile e si apụ nʼobodo ahụ nche, ka ha nwe ike gbuo ya.
ACT 9:25 Ma ụmụazụ ya kunyere ya na nkata amanyere ụdọ bufee ya nʼofe mgbidi nke obodo.
ACT 9:26 Mgbe o rutere Jerusalem, ọ gbalịrị ịdịnyere ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ nʼebe ahụ, ma ha tụrụ egwu. Ha ekwenyeghị na ọ ghọọla ezi onye na-eso ụzọ Jisọs dịka ha.
ACT 9:27 Ma Banabas duuru ya gaa nʼebe ndị ozi nọ. Ọ kọọrọ ha akụkọ otu o siri hụ Onyenwe anyị na otu o siri gwakwa ya okwu. Na otu o siri kwusaa oziọma nʼaha Jisọs na Damaskọs na-atụghị egwu.
ACT 9:28 O soro ha na-agagharị na Jerusalem. Ọ na-ekwusakwa okwu nʼaha Onyenwe anyị na-atụghị egwu.
ACT 9:29 Ya na ndị Juu na-asụ asụsụ Griik rụrịtakwara ụka. Nʼihi ya ndị a gbara izu igbu ya.
ACT 9:30 Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ banyere nzube ha, ha duuru ya gaa Sizaria site nʼebe ahụ zipụ ya ka ọ laa obodo Tasọs.
ACT 9:31 Mgbe ahụ, nzukọ niile ndị nọ na Judịa, Galili na Sameria, nọọrọ nʼudo, guzosiekwa ike. Ha na-amụba nʼọnụọgụgụ site nʼịtụ egwu nke Onyenwe anyị na ịgbaume nke Mmụọ Nsọ.
ACT 9:32 Pita na-ejegharị nʼetiti ndị kwere ekwe, ọ gakwara leta ndị nsọ nọ nʼobodo Lida.
ACT 9:33 Nʼebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Ainias. Nwoke a anọọla nʼute ọrịa afọ asatọ. Ọ bụ onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
ACT 9:34 Pita sịrị ya, “Ainias, Jisọs Kraịst agwọọla gị. Bilie mezie ute gị.” Ngwangwa, Ainias biliri ọtọ.
ACT 9:35 Ndị niile bi na Lida na Sharọn hụrụ ya. Nʼihi ya, ha nabatara Onyenwe anyị.
ACT 9:36 Nʼobodo Jopa, e nwere otu onye nwanyị na-eso ụzọ ya, nke aha ya bụ Tabita nke pụtakwara Dọkas na asụsụ Griik. O jupụtara nʼọrụ ọma, na ọrụ obi ebere nʼebe ụmụ ogbenye nọ.
ACT 9:37 Nʼoge a, ọ rịara ọrịa, nwụọ. Mgbe ha sachara ya ahụ, ha nibere ya nʼotu ime ụlọ dị nʼụlọ elu.
ACT 9:38 Jopa dịkwa nso na Lida. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ na Pita nọ nʼebe ahụ, ha ziri ụmụ nwoke abụọ ozi ka a rịọọ ya, sị, “Biko, ahapụla ịbịakwute anyị ngwangwa.”
ACT 9:39 Pita biliri soro ha gawa, mgbe o ruru, ha duuru ya gbago nʼụlọ elu nʼime ụlọ ahụ. Ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ nọ nʼebe ahụ na-ebe akwa, na-egosi uwe Dọkas dụụrụ ha mgbe ọ dị ndụ.
ACT 9:40 Pita chụpụrụ ha niile nʼezi, gbuo ikpere nʼala, kpee ekpere. Ọ tụgharịrị chee ozu ahụ ihu sị, “Tabita, bilie.” O meghere anya ya, ma mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri, nọdụ ala.
ACT 9:41 O nyeere ya aka ka ọ kwụrụ ọtọ. Ọ kpọrọ ndị nsọ niile nọ nʼebe ahụ, ha na ụmụ nwanyị ahụ di ha nwụrụ gosi ha na ọ dị ndụ.
ACT 9:42 A nụrụ akụkọ ihe a mere nʼebe niile na Jopa, nke mere ka ọtụtụ kwere nʼOnyenwe anyị.
ACT 9:43 Ọ nọgidere na Jopa ọtụtụ ụbọchị. Ọ nọdụrụ nʼụlọ Saimọn, onye ọrụ ya bụ idozi akpụkpọ anụ.
ACT 10:1 Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke bi na Sizaria, aha ya bụ Kọnelịọs. O bụ ọchịagha na-elekọta narị ndị agha si na mpaghara Itali.
ACT 10:2 Nwoke a na ezinaụlọ ya bụ ndị na-asọpụrụ ma na-atụkwa egwu Chineke. Ọ na-enyere ndị ogbenye aka na-ekpekwara Chineke mgbe niile.
ACT 10:3 Otu ụbọchị, nʼihe dịka elekere atọ nke ehihie, ọ hụrụ ọhụ ebe otu mmụọ ozi nke Chineke bịakwutere ya sị ya, “Kọnelịọs!”
ACT 10:4 Kọnelịọs lekwasịrị ya anya nʼegwu jụọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụ gịnị?” Ọ sịrị ya, “Ekpere gị na onyinye gị nye ndị ogbenye e rutela dịka ihe ncheta nʼihu Chineke.
ACT 10:5 Ugbu a, zie ndị ikom ka ha gaa nʼobodo Jopa kpọta otu onye aha ya bụ Saimọn, onye a na-akpọkwa Pita.
ACT 10:6 Ọ bụ ọbịa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. Onye ụlọ ya dị nʼakụkụ osimiri.”
ACT 10:7 Mgbe mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu pụrụ, ọ kpọrọ ndị ohu ya abụọ na otu nʼime ndị agha na-eche ya nche nke na-atụkwa egwu Chineke.
ACT 10:8 Mgbe ọ kọchara ha ihe niile, o zigara ha Jopa.
ACT 10:9 Nʼechi ya, mgbe ha nọ nso nʼebe ahụ, nʼihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihie, Pita rigooro nʼelu ụlọ ahụ ikpe ekpere.
ACT 10:10 Agụụ bidoro ịgụ ya, ọ chọọ ihe ọ ga-eri. Ma mgbe a na-akwado nri, ọ hụrụ ọhụ.
ACT 10:11 Ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ihe dịka akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata nʼala.
ACT 10:12 Ihe dị nʼime ya: bụ ụmụ anụmanụ dị iche iche, ndị nwere ụkwụ anọ, ma anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke igwe.
ACT 10:13 Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu na-asị, “Pita bilie, gbuo ma riekwa.”
ACT 10:14 Ma Pita sịrị, “Mba, Onyenwe m. Ọ dịbeghị mgbe m riri ihe ọbụla rụrụ arụ maọbụ nke na-adịghị ọcha.”
ACT 10:15 Olu ahụ gwara ya nke ugboro abụọ, “Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.”
ACT 10:16 Ihe a mere ugboro atọ, ngwangwa, e weghachikwara ya nʼeluigwe.
ACT 10:17 Mgbe Pita nọ na-atule ihe ọhụ ahụ pụtara bụ nke gbakwara ya gharịị, lee, ndị ikom ahụ Kọnelịọs zipụrụ abịarutela kwụsị nʼọnụ ụzọ, na-ajụ ebe ụlọ Saimọn dị.
ACT 10:18 Ha kpọrọ oku ịjụ ma Saimọn onye a na-akpọ Pita ọ nọ nʼụlọ ahụ.
ACT 10:19 Ka Pita nọrịị na-atụgharị uche nʼihe ọhụ ahụ pụtara, Mmụọ Nsọ gwara ya, “Lee, mmadụ atọ guzo nʼọnụ ụzọ ugbu a. Ha chọkwara ịhụ gị.
ACT 10:20 Bilie, rịda jekwuru ha ngwangwa, enwela obi abụọ ị soro ha gawa, nʼihi na ọ bụ m zitere ha.”
ACT 10:21 Pita jekwuru ndị ikom ahụ, sị, “Ọ bụ m bụ onye unu na-achọ, gịnị ka unu na-achọrọ m?”
ACT 10:22 Ha sịrị, “Ọ bụ Kọnelịọs onyeisi agha na-elekọta narị ndị agha zitere anyị. Ọ bụ onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke, bụrụkwa onye ndị Juu niile na-asọpụrụ. Mmụọ ozi dị nsọ gwara ya ka ọ kpọta gị nʼụlọ ya, ịnụ ihe i nwere ikwu.”
ACT 10:23 Ya mere, ọ kpọbatara ha nʼụlọ dịka ndị ọbịa. Echi ya, o biliri soro ha gawa, ụfọdụ ndị kwere ekwe na Jopa sokwara ya gaa.
ACT 10:24 Nʼụbọchị na-esota ya, ha bịaruru Sizaria. Kọnelịọs nọrịị na-eche ha, ya na ndị ezinaụlọ ya, na ndị ikwu na ibe ya, na ndị enyi ya ọ kpọrọ.
ACT 10:25 Mgbe Pita batara, Kọnelịọs zutere ya, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọrọ ya isi nʼala.
ACT 10:26 Ma Pita selitara ya elu sị, “Bilie ọtọ, mụ onwe m bụkwa mmadụ.”
ACT 10:27 Mgbe ha na-ekwurịta okwu, ọ banyere nʼime ụlọ ma hụ igwe mmadụ ka ha zukọtara.
ACT 10:28 Ọ sịrị ha, “Unu maara nke ọma na ọ bụ ihe megidere iwu na onye Juu na onye mba ọzọ ga-enwe mmekọrịta maọbụ gaa leta onye mba ọzọ. Ma Chineke ezila m na m ekwesighị ịkpọ mmadụ ọbụla onye rụrụ arụ maọbụ onye na-adịghị ọcha.
ACT 10:29 Nʼihi nke a, ọ bụ ya mere m jiri bịa mgbe akpọrọ m na-ajụghị ajụjụ. Ma ka m jụọ ugbu a ihe mere unu ji kpọọ m?”
ACT 10:30 Kọnelịọs sịrị, “Nʼụbọchị anọ gara aga, mgbe m nọ na-ekpe ekpere nʼoge ehihie nʼụlọ m, nʼihe dịka elekere atọ, na mberede, ahụrụ m nwoke yi uwe na-enwu ọcha ka o guzoro nʼihu m.
ACT 10:31 Ọ sịrị, Kọnelịọs, ‘Chineke anụla ekpere gị ma chetakwa onyinye ị na-enye ndị ogbenye.
ACT 10:32 Ziga nʼobodo Jopa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. O bi nʼakụkụ osimiri.’ Nʼebe ahụ ha ga-ahụkwa otu onye ọbịa aha ya bụ Saimọn a na-akpọ Pita.
ACT 10:33 Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji mee ngwangwa zie ka a kpọọ gị. Ọ dị mma na ị bịara. Ugbu a, anyị niile ezukọtala nʼebe a nʼihu Chineke ịnụrụ ihe niile Onyenwe anyị chọrọ ka ị gwa anyị.”
ACT 10:34 Mgbe ahụ Pita meghere ọnụ ya sị, “Ugbu a, aghọtala m nʼezie na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya nʼihu.
ACT 10:35 Kama nʼime mba ọbụla, onye ọbụla na-atụ egwu ya na onye na-arụ ọrụ ezi omume ka ọ na-anabata.
ACT 10:36 Unu maara ihe banyere oziọma ahụ o zigaara ndị Izrel niile, nke na-akọ akụkọ oziọma nke udo site na Jisọs Kraịst onye bụ Onyenwe anyị nʼihe niile.
ACT 10:37 Okwu ahụ gbasara nʼala Judịa niile, malite na Galili mgbe Jọn kwusachara baptizim nke ya.
ACT 10:38 Otu Chineke si were Mmụọ Nsọ na ike wụkwasị Jisọs onye Nazaret dịka mmanụ, na otu o si jegharịa na-eme mma na-agwọkwa ndị niile ekwensu na-emekpa ahụ, nʼihi na Chineke nọnyeere ya.
ACT 10:39 “Anyị bụ ndị akaebe ihe niile o mere nʼala ndị Juu na nʼime Jerusalem. Ha gburu ya site nʼịkpọgide ya nʼelu obe.
ACT 10:40 Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilite mgbe ụbọchị atọ gasịrị. E mekwara ka ndị mmadụ hụ ya anya.
ACT 10:41 Ọ bụghị mmadụ niile kama ọ bụ naanị anyị ndị Chineke họpụtara, dịka ndị akaebe, ndị soro ya rie ma ṅụọkwa mgbe o si nʼọnwụ bilie.
ACT 10:42 O nyere anyị iwu ka anyị gaa zisaa oziọma nʼebe niile, ịkọwa na ọ bụ ya ka Chineke họpụtara ịbụ onye ikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.
ACT 10:43 Ndị amụma niile gbara ama ihe banyere ya na onye ọbụla nke kweere na ya ga-enweta mgbaghara mmehie site nʼaha ya.”
ACT 10:44 Mgbe Pita nọ na-ekwu okwu, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ndị niile nụrụ okwu a.
ACT 10:45 Nke a juru ndị e biri ugwu nʼetiti ndị kwere ekwe soro Pita bịa anya otu e siri mee ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ ahụ.
ACT 10:46 Nʼihi na ha nụrụ ka ha na-ekwu okwu nʼasụsụ dị iche iche na-etokwa Chineke. Mgbe ahụ Pita jụrụ,
ACT 10:47 “Ọ dị onye pụrụ igbochi anyị ime ndị a baptizim. Ndị natara Mmụọ Nsọ dị ka anyị onwe anyị?”
ACT 10:48 Nʼihi nke a, o nyere iwu ka e mee ha baptizim nʼaha Jisọs Kraịst. Ha rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụbọchị ole na ole.
ACT 11:1 Ndị ozi na ụmụnna ndị bi na Judịa niile nụrụ na ndị mba ọzọ anabatala okwu Chineke.
ACT 11:2 Mgbe Pita ruru Jerusalem, ndị kwere ekwe e biri ugwu tara ya ụta,
ACT 11:3 na-asị, “Gịnị mere ị ji gakwuru ndị a na-ebighị ugwu soro ha rie ihe?”
ACT 11:4 Pita kọwaara ha ihe niile mere na otu o si mee, na-asị.
ACT 11:5 “Otu ụbọchị, mgbe m nọ nʼobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nʼoge m na-ekpe ekpere. Nʼime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata site nʼeluigwe. E budatara ya nʼihu m.
ACT 11:6 Nʼime ya, ahụrụ m anụmanụ ndị nwere ụkwụ anọ, na anụ ọhịa, na anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke eluigwe.
ACT 11:7 Mgbe ahụ, anụrụ m olu gwara m sị, ‘Pita, bilie, gbuo ma riekwa.’
ACT 11:8 “Ma asịrị m, ‘Mba, Onyenwe m, ọ dịbeghị mgbe ihe na-adịghị ọcha maọbụ ihe rụrụ arụ bara m nʼọnụ.’
ACT 11:9 “Olu ahụ siri nʼeluigwe zaghachi nke ugboro abụọ, ‘Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.’
ACT 11:10 Nke a mere ugboro atọ, ma emesịa dọlie ha niile laa nʼeluigwe.
ACT 11:11 “Nʼotu oge ahụ, ndị ikom atọ ndị e zipụrụ site Sizaria ịkpọ m bịarutere kwụsị nʼọnụ ụzọ nʼụlọ ebe m nọ.
ACT 11:12 Mmụọ Nsọ gwara m ka m ghara inwe obi abụọ isoro ha na-akpaghị oke ọbụla. Mmadụ isii ndị a nʼetiti ụmụnna anyị sokwa m, bịarute nʼụlọ nwoke ahụ.
ACT 11:13 Ọ gwara anyị otu o si hụ mmụọ ozi nʼụlọ ya, onye sịrị, ‘Ziga ndị ozi jee Jopa ka ha kpọta Saimọn onye a na-akpọ Pita.
ACT 11:14 Ọ ga-ewetara gị ozi nke a ga-esite na ya zọpụta gị nʼezinaụlọ gị niile.’
ACT 11:15 “Mgbe m ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ha dịka o siri bịakwasị anyị na mbụ.
ACT 11:16 Mgbe ahụ, echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru sị, ‘Jọn ji mmiri mee unu baptizim, ma a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.’
ACT 11:17 Ya mere, ọ bụrụ na Chineke nyere ha otu onyinye ahụ o nyere anyị mgbe anyị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye ka m bụ iguzogide Chineke?”
ACT 11:18 Mgbe ha nụrụ nke a, ha agaghị nʼihu nʼịrụ ụka kama ha toro Chineke, na-asị, “Nʼezie, Chineke enyela ohere ka ọ bụladị ndị mba ọzọ chegharịa baa na ndụ.”
ACT 11:19 Ugbu a, ndị ahụ niile gbasasịrị nʼihi mkpagbu ahụ bidoro mgbe a tụgburu Stivin na nkume, jeruru akụkụ Fonisia na Saiprọs na Antiọk na-ekwusa oziọma ahụ naanị nʼetiti ndị Juu.
ACT 11:20 Ma otu ọ dị, ụfọdụ nʼime ndị ikom ndị ahụ sitere nʼakụkụ Saiprọs na Sirini gara Antiọk, malite ikwusara ndị Griik oziọma banyere Onyenwe anyị Jisọs.
ACT 11:21 Onyenwe anyị gọziri mgbalị ha niile. Nʼihi na ọtụtụ mmadụ chegharịrị kwere nʼOnyenwe anyị.
ACT 11:22 Mgbe nzukọ dị na Jerusalem nụrụ ihe ndị a, ha zipụrụ Banabas ka ọ gaa Antiọk.
ACT 11:23 Mgbe o rutere, hụ ihe amara Chineke rụrụ nʼetiti ha. Ọ ṅụrịrị ọṅụ, mgbakwaa ha niile ume, gwa ha ka ha were obi ha niile nọgide nʼime Onyenwe anyị.
ACT 11:24 Ọ bụ ezigbo mmadụ, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ na okwukwe. O nwekwara okwukwe dị ebube, nʼihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị.
ACT 11:25 Emesịa, ọ gara Antiọk obodo Tasọs ịchọ Sọl.
ACT 11:26 Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịa nʼAntiọk. Ihe ha ka otu afọ, ka ha na-ezukọ nʼụlọ chọọchị na-akụziri ọtụtụ igwe mmadụ ihe. Ọ bụ nʼime Antiọk ka e buru ụzọ kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ndị Kraịst.
ACT 11:27 Nʼoge ahụ, ndị amụma sitere na Jerusalem bịaruru Antiọk.
ACT 11:28 Otu onye nʼime ha a na-akpọ Agabọs biliri ọtọ buo amụma site nʼike Mmụọ Nsọ banyere oke ụnwụ ga-abịakwasị ụwa niile. Amụma a mezukwara nʼoge Klọdiọs na-achị.
ACT 11:29 Ndị na-eso ụzọ ya kwekọrịtara ịtụkọta na iziga onyinye dị iche iche nye ndị kwere ekwe nọ na Judịa. Onye ọbụla nyekwara ihe dịka o nwere ike.
ACT 11:30 Ha mere nke a, ha zigara ndị okenye ihe ha tụkọtara, site nʼaka Banabas na Sọl.
ACT 12:1 Nʼoge ahụ, eze Herọd jidere ụfọdụ ndị so na chọọchị buru nʼobi ịkpagbu ha.
ACT 12:2 O jiri mma agha gbuo Jemis nwanne Jọn.
ACT 12:3 Mgbe ọ chọpụtara na omume ya tọrọ ndị Juu ụtọ, ọ gara nʼihu jidekwa Pita. Nke a mere nʼoge mmemme Achịcha Ekoghị eko.
ACT 12:4 Mgbe o jidere ya, o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ ebe o mere ka ndị agha chee ya nche, ndị agha anọ nʼotu oge, ndị agha anọ ọzọ nʼoge nke ọzọ. Ebumnobi ya bụ ịkpọpụta ya nʼihu ọha mmadụ kpee ya ikpe mgbe Mmemme Ngabiga gasịrị.
ACT 12:5 Mgbe e debere Pita nʼụlọ mkpọrọ, nzukọ esepụghị aka nʼikpe ekpere nʼihi ya nye Chineke.
ACT 12:6 Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche.
ACT 12:7 Na mberede mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara guzoro nʼebe ahụ, ìhè nwukwara nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kutụrụ Pita aka nʼakụkụ sị, “Ngwangwa, bilie ọtọ!” Eriri igwe ahụ dapụrụ nʼaka ya.
ACT 12:8 Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Yiri uwe gị na akpụkpọụkwụ gị.” O mere otu ahụ, Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya, “Yirikwa akwa mgbokwasị gị soro m.”
ACT 12:9 Pita sooro ya nʼazụ, o chere na ọ na-ahụ ọhụ, ma ọ mataghị na ihe mmụọ ozi ahụ na-eme bụ ezie.
ACT 12:10 Ha gafere ndị nche nke mbụ na nke abụọ rute nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime obodo, nke bụ ọnụ ụzọ igwe. Ọnụ ụzọ igwe ahụ meghekwara nʼonwe ya, ha esite na ya gafee. Mgbe ha gara ije ruo ebe tere anya nʼama nke ọzọ, ngwangwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya.
ACT 12:11 Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe niile mere. O kwuru, “Ugbu a, amatala m nʼezie, na Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya, ka ọ bịa zọpụta m site nʼaka eze Herọd na ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya. Ugbu a ọ napụtakwala m site nʼọchịchọ ọjọọ niile nke ndị Juu.”
ACT 12:12 Mgbe ọ ghọtara ihe merenụ, ọ gawara nʼụlọ Meri nne Jọn onye a na-akpọkwa Mak, ebe ọtụtụ mmadụ zukọtararị na-ekpe ekpere.
ACT 12:13 Mgbe ọ kụrụ aka nʼọnụ ụzọ ama, otu odibo nwanyị aha ya bụ Roda bịara ka o zaa ya.
ACT 12:14 Mgbe ọ nụrụ olu Pita, ọṅụ juru ya obi nke mere na ọ gbaara ọsọ laghachi azụ nʼemegheghị ụzọ. Ọ gara tisaa, “Ọ bụ Pita nọ nʼọnụ ụzọ!”
ACT 12:15 Ha sịrị ya na ọ na-ekwu okwu dịka onye uche ya na-ezughị oke. Mgbe ọ nọgidesịrị ike na-ekwu otu ihe ahụ, ha sịrị, “Ọ ghaghị ị bụ mmụọ ozi ya.”
ACT 12:16 Ma Pita nọgidere na-akụ aka nʼụzọ. Mgbe ha meghere ụzọ hụ ya, ọ gbagwojuru ha anya.
ACT 12:17 O feere ha aka ka ha mechie ọnụ. Ọ kọọrọ ha otu Onyenwe anyị si dupụta ya site nʼụlọ mkpọrọ. Ọ gwara ha, “Meenụ ka Jemis na ụmụnna anyị niile mata ihe ndị a.” Ọ pụrụ gawa ebe ọzọ.
ACT 12:18 Nʼisi ụtụtụ echi ya, oke ọgbaaghara dị nʼetiti ndị agha, ebe ha na-eche ihe mere Pita.
ACT 12:19 Mgbe Herọd chọgharịchara ya ma ọ chọtaghị ya, ọ jụrụ ndị nche ahụ ajụjụ dị iche iche. Nʼikpeazụ ọ nyere iwu ka e gbuo ha. Emesịa ọ hapụrụ Judịa gaa Sizaria nọdụ nʼebe ahụ.
ACT 12:20 Nʼoge ahụ Herọd na-eweso ndị Taịa na Saịdọn iwe, ha zipụrụ ndị ozi ha izute ya. Ha buru ụzọ mee ka ha na Blastọs bụrụ enyi, onye eze tụkwasịrị obi nke na-elekọtakwa ime ụlọ ndina eze anya. Ha rịọrọ ya ka udo dịrị, nʼihi na a na-esi nʼobodo eze na-enwetara ha ihe oriri.
ACT 12:21 Nʼụbọchị nzukọ ahụ, Herọd gbokwasịrị uwe ndị eze ya nọkwasị nʼocheeze ya. O weere oke olu dị iche gwa nzukọ ahụ niile okwu.
ACT 12:22 Igwe mmadụ ahụ nọ na-eti mkpu, “Nke a abụghị olu mmadụ, ọ bụ olu chi!”
ACT 12:23 Nʼotu oge ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti dị egwu nʼihi na o nyeghị Chineke otuto ma otu. Ikpuru ripịara ya ahụ, nke mere ka ọ nwụọ.
ACT 12:24 Ma okwu Chineke gara nʼihu na-aba ụba na-agbasakwa.
ACT 12:25 Mgbe ha rụchara ọrụ ha, Banabas na Sọl si Jerusalem lọghachi. Ha kpọọrọ Jọn onye a na-akpọkwa Mak nʼije ha.
ACT 13:1 Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ dị nʼAntiọk. Ụfọdụ nʼime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Manaen (onye azụlitekọrọ ya na eze Herọd), na Sọl.
ACT 13:2 Mgbe ha nọ na-efe Onyenwe anyị ofufe na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, “Kewapụtaranụ m Banabas na Sọl, nʼihi ọrụ ahụ nke m kpọrọ ha.”
ACT 13:3 Ya mere, mgbe ha busiri ọnụ kpekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka nʼisi zipụ ha.
ACT 13:4 Ebe Mmụọ Nsọ zipụrụ ha, ha gbadara Selusia, sitekwa ebe ahụ gbadaa Saiprọs.
ACT 13:5 Mgbe ha bịaruru Salamis, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu kwusaa okwu Chineke. Jọn sokwa ha dịka onye na-ejere ha ozi.
ACT 13:6 Mgbe ha gazuchara obodo niile ndị ahụ mmiri gbara gburugburu ruo Pafọs, ha zutere otu onye mgbaasị, onye Juu bụ onye amụma ụgha a na-akpọ Ba-Jisọs.
ACT 13:7 Ya na otu onye ọchịchị obodo, aha ya bụ Sajiọs Pọlọs nọ. Ọ bụ nwoke nwere ọgụgụisi nʼebe ọ dị ukwuu, ọ kpọrọ Banabas na Sọl ka ha gwa ya okwu nke Chineke.
ACT 13:8 Ma onye mgbaasị ahụ, onye aha ya bụkwa Elimas (nʼihi nke a bụ aha ya ma asụgharịa ya) malitere igbochi ha site nʼimegharị onyeisi ahụ anya ka ọ ghara ịnabata okwukwe ahụ.
ACT 13:9 Ma Sọl, onye aha ya bụkwa Pọl, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, legidere ya anya
ACT 13:10 sị, “Gị nwa ekwensu, jupụtara nʼaghụghọ na nʼihe ọjọọ dị iche iche. Gị onye iro nke ezi omume niile. Ọ bụ na i gaghị akwụsị imerụ ụzọ niile ziri ezi nke Onyenwe anyị?
ACT 13:11 Nʼihi ya lee, iwe nke Onyenwe anyị ga-adakwasị gị. Ị ga-ekpụ ìsì nwa oge, ị gaghị enwe ike hụ ìhè nke anyanwụ.” Nʼotu oge ahụ, ọ hụkwaghị ụzọ ọzọ. Ọ malitere na-ebigharị aka, na-achọkwa onye ga na-edugharị ya.
ACT 13:12 Mgbe onyeisi ahụ hụrụ ihe mere, o kweere, nʼihi na o juru ya anya bụ ozizi nke okwu Onyenwe anyị.
ACT 13:13 Pọl na ndị otu ya ji ụgbọ mmiri site na Pafọs garuo Pega nke dị nʼala Pamfilia. Nʼebe a ka Jọn hapụrụ ha laghachi Jerusalem.
ACT 13:14 Site na Pega ha gara ruo Antiọk obodo nke dị na Pisidia. Nʼụbọchị izuike, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu nọdụ ala.
ACT 13:15 Mgbe a gụpụtasịrị site nʼakwụkwọ iwu na nke ndị amụma, ndịisi ụlọ ekpere ahụ zigara ya ozi, sị, “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ịgbaume nye anyị, biko kwuonụ ya.”
ACT 13:16 Pọl guzoro ọtọ nʼetiti ha feere ha aka ya, sị, “Unu ndị Izrel na unu ụmụnna m ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Geenụ m ntị.
ACT 13:17 Chineke nke Izrel họpụtara nna nna anyị ha mee ha mba dị ukwu nʼoge ha nọ nʼobodo Ijipt. O ji ike aka ya dupụta ha site nʼala ahụ.
ACT 13:18 Ọ nagidere ha iri afọ anọ nʼime ọzara.
ACT 13:19 O bibiri mba asaa dị ukwuu nʼime ala Kenan nʼihi ha, nyekwa ndị ya obodo a ka ọ bụrụ nke ha.
ACT 13:20 Nke a bụ ihe dị ka narị afọ anọ na iri afọ ise. “Mgbe nke a gasịrị, o nyere ha ndị ikpe dị iche iche ruo oge Samuel onye amụma.
ACT 13:21 Mgbe ahụ ha rịọrọ ka enye ha eze, Chineke nyekwara ha Sọl, nwa Kish, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta, onye chịrị iri afọ anọ.
ACT 13:22 Mgbe o wepụsịrị ya, o mere Devid ka ọ bụrụ eze ha. Ọ gbara ama banyere ya sị, ‘Achọtala m Devid nwa Jesi, nwoke nke dị ka ọchịchọ obi m nke si dị. Ọ bụkwa onye ga-eme ihe niile m chọrọ ka o mee.’
ACT 13:23 “Jisọs onye si nʼezinaụlọ Devid pụta ka Chineke wetaara Izrel Onye nzọpụta ahụ bụ Jisọs, dịka o kwere nkwa izite.
ACT 13:24 Ma tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusala nye ndị Izrel banyere baptizim nke nchegharị.
ACT 13:25 Nʼoge Jọn na-arụsị ọrụ ya, ọ na-asị, ‘Onye ka unu chere na m bụ? Abụkwaghị m onye ahụ. Mba! Abụghị m ya. Ma otu onye ahụ na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.’
ACT 13:26 “Ya mere, ụmụnna m, ndị si nʼagbụrụ Ebraham na ndị niile na-atụ egwu Chineke, ozi nke nzọpụta a dịrị anyị niile.
ACT 13:27 Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha amataghị ya, nke ha ji aghọta okwu ndị amụma nke a na-agụpụtara ha kwa izu, bụ nʼụbọchị izuike. Ma ha mere ka okwu ahụ mezuo, mgbe ha mara ya ikpe ọnwụ.
ACT 13:28 Ọ bụ ezie na ha achọtaghị ihe kwesiri ọnwụ nʼaka ya. Ma ha rịọrọ Pailet ka o nye ike ka e gbuo ya.
ACT 13:29 Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha budatara ya site nʼelu obe, lie ya.
ACT 13:30 Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilie.
ACT 13:31 Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya.
ACT 13:32 “Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha.
ACT 13:33 O mezuola ha nye anyị bụ ụmụ ha, site na-ime ka Jisọs site nʼọnwụ bilie, dịka e dere ya nʼakwụkwọ Abụ ọma, “ ‘Ị bụ ọkpara m, taa abụrụla m nna gị.’
ACT 13:34 Ma banyere ime ka o site nʼọnwụ bilie, ka ọ ghara ịlaghachi nʼire ure ọzọ. Nke a bụ ihe o kwuru, “ ‘Aga m emezuru gị nkwa nsọ ahụ niile m kwere Devid.’
ACT 13:35 E dekwara ya nʼebe ọzọ nʼabụ ọma, “ ‘Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.’
ACT 13:36 “Mgbe Devid rụzuru ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ nʼọgbọ ha, ọ nwụrụ, e likọọ ya na ndị nna nna ya ha o rekwara ure.
ACT 13:37 Ma onye ahụ Chineke mere ka o site nʼọnwụ bilite erekwaghị ure.
ACT 13:38 “Ya mere, ụmụnna m, achọrọ m ka o doo unu anya na mgbaghara mmehie dịkwa nʼime nwoke a, bụ Jisọs, anyị na-ekwusa nye unu.
ACT 13:39 A na-esite na ya gụọ onye ọbụla kwere nʼonye ezi omume ọ bụladị site nʼihe ndị ahụ niile nke iwu Mosis na-apụghị ịgụ unu dị ka ndị ezi omume.
ACT 13:40 Lezienụ anya ka ihe niile ndị amụma kwuru ghara ịdakwasị unu.
ACT 13:41 “ ‘Lee, unu ndị na-akwa emo, nọrọnụ na mgbagwoju anya ma lakwanụ nʼiyi. Nʼihi na agaje m ime otu ihe nʼụbọchị unu nke unu na-agaghị ekwe na o mere, ọ bụladị na mmadụ kọrọ unu maka ya.’”
ACT 13:42 Mgbe Pọl na Banabas na-apụ, ndị mmadụ rịọrọ ha ka ha bịakwa nʼizu ụka ọzọ gwa ha okwu gbasara ihe ndị a.
ACT 13:43 Mgbe a gbasara nzukọ ahụ, ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke sooro Pọl na Banabas, ndị gwara ha okwu, rịọsiekwa ha ike ka ha nọgide nʼamara Chineke.
ACT 13:44 Nʼụbọchị izuike ọzọ ahụ, ọtụtụ ndị bi nʼobodo ahụ pụtara ịnụrụ okwu Onyenwe anyị.
ACT 13:45 Mgbe ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, obi ha jupụtara nʼekworo, ha bidokwara ikwu okwu ọjọọ megide okwu niile Pọl na-ekwu.
ACT 13:46 Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ.
ACT 13:47 Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu, “ ‘Emeela m ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka ị nwee ike weruo nzọpụta nʼebe niile ụwa sọtụrụ.’”
ACT 13:48 Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ, ha sọpụkwara okwu nke Onyenwe anyị. Ya mere ndị niile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi bụ ndị kwenyerenụ.
ACT 13:49 Ya mere okwu Onyenwe anyị gbasara ruo ebe niile nʼobodo ahụ.
ACT 13:50 Mgbe ahụ, ndị Juu kpaliri obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke ndị ọnọdụ ha dị elu, na ndị ikom ndị nke ndu obodo ahụ. Ha kpasuru mkpagbu megide Pọl na Banabas si otu a, chụpụ ha site nʼobodo ahụ.
ACT 13:51 Ha tichapụrụ aja dị nʼụkwụ ha ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka na ntị mmegide ha. Ha hapụrụ obodo ahụ gaa Aikoniọm.
ACT 13:52 Ma ndị na-eso ụzọ ya jupụtakwara nʼọṅụ na nʼike nke Mmụọ Nsọ.
ACT 14:1 Nʼobodo Aikoniọm, Pọl na Banabas banyekwara nʼụlọ nzukọ ndị Juu, kwuo okwu nʼụzọ pụrụ iche nke mere nʼọtụtụ mmadụ, ndị Juu na ndị mba ọzọ kwenyekwara.
ACT 14:2 Ndị Juu, ndị na-anabataghị okwu ahụ, kpaliri ndị mba ọzọ mee ka mkpụrụobi ha jọọ njọ megide ụmụnna.
ACT 14:3 Otu ọ dị, ha nọgidere nʼebe ahụ ogologo oge, na-ekwusakwa okwu nke Onyenwe anyị na-atụghị egwu ọbụla. Onye nke gosikwara na ọ bụ okwu amara ya ka ha na-ekwu site nʼinye ha ike ịrụ ọrụ ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche.
ACT 14:4 Ma ndị obodo ahụ kewara abụọ, ụfọdụ nʼime ha dịnyere ndị Juu. Ụfọdụ dịnyekwara ndị ozi.
ACT 14:5 Mgbe ndị mba ọzọ, na ndị Juu, ha na ndị ndu ha, gbara izu ime ha ihe ihere, tụọkwa ha nkume.
ACT 14:6 Ndị ozi ahụ matara nzube ha site nʼebe ahụ gbapụ ọsọ gbaruo nʼakụkụ Laikonia, gbaba nʼime obodo Listra na Debi na obodo nta ndị ọzọ ndị dị nʼakụkụ ebe ahụ.
ACT 14:7 Nʼebe ahụ, ha gara nʼihu na-ekwusakwa oziọma ahụ.
ACT 14:8 Nʼobodo Listra, o nwere otu nwoke dara ngwụrọ site nʼoge a mụrụ ya. Nwoke a ejibeghị ụkwụ ya abụọ gaa ije mgbe ọbụla.
ACT 14:9 O gere ntị mgbe Pọl na-ekwu okwu. Onye legidere ya anya hụ na ọ nwere okwukwe nke a ga-eji mee ka a gwọọ ya,
ACT 14:10 were oke olu sị, “Guzoro nʼụkwụ gị abụọ.” Nwoke ahụ wuliri elu malite ịga ije.
ACT 14:11 Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ ihe Pọl mere, ha tiri mkpu nʼasụsụ Laikonia sị, “Ndị a bụ chi bịakwutere anyị nʼụdịdị mmadụ.”
ACT 14:12 Banabas ka ha kpọrọ Zeus ma kpọkwa Pọl Hamis nʼihi na ọ bụ ya bụ onye ọka okwu.
ACT 14:13 Onye nchụaja Zeus, nke ụlọ arụsị ya dị nso nʼihu obodo, kpụtara oke ehi wetakwa okoko osisi dị iche iche. Ya na igwe mmadụ ahụ chọrọ ịchụ aja nye ha nʼọnụ ụzọ ama ha.
ACT 14:14 Mgbe ndị ozi ahụ, Banabas na Pọl nụrụ ihe ndị a, ha dọwara uwe ha, gbara ọsọ jekwuru igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu,
ACT 14:15 na-asị, “Ndị ikom, gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ oziọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nʼịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bịakwute Chineke dị ndụ. Onye kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe niile dị nʼime ha.
ACT 14:16 Nʼoge gara aga, ọ hapụrụ mba niile ka ha na-eme ihe masịrị ha.
ACT 14:17 Nʼagbanyeghị nke a ọ hapụghị ị debere onwe ya ihe ndị ga-agbara ya akaebe, site nʼọrụ ọma ya niile. Dị ka inye unu mmiri ozuzo site nʼeluigwe, na mkpụrụ nke ala nʼoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri na-emekwa ka obi na-atọ unu ụtọ.”
ACT 14:18 Nʼagbanyeghị okwu ndị a, ọ rara ha ahụ igbochi igwe mmadụ ahụ ịchụrụ ha aja.
ACT 14:19 Ma ndị Juu sitere nʼAntiọk na Aikoniọm bịara kpalie obi igwe mmadụ ahụ. Nʼihi ya, ha tụrụ Pọl nkume, dọkpụrụ ya pụọ nʼobodo, chee na ọ nwụọla.
ACT 14:20 Ma mgbe ndị na-eso ụzọ bịara gbaa ya gburugburu, o bilitere, laghachikwa nʼime obodo ahụ. Ma nʼechi ya, ya na Banabas sooro gaa Debi.
ACT 14:21 Ha zisasịrị oziọma nʼime obodo ahụ, nke mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha lọghachiri nʼobodo Listra site ya gaa Aikoniọm na Antiọk.
ACT 14:22 Nʼebe ahụ ha gbara ndị na-eso ụzọ ume kasịekwa ha obi sị ha jidesie okwukwe ahụ ike. Ha sịrị, “Anyị ga-agabiga ọtụtụ mkpagbu dị iche iche tupu anyị abaa nʼalaeze Chineke.”
ACT 14:23 Mgbe ha họpụtachara ndị okenye nʼime nzukọ niile. Ha sitere nʼobubu ọnụ na ekpere tinye ha nʼaka Onyenwe anyị, bụ onye ha kwenyere na ya.
ACT 14:24 Ha sitere nʼakụkụ Pisidia garuo Pamfilia.
ACT 14:25 Mgbe ha zisachara oziọma nʼobodo Pega, ha gbadara gaa Atalia.
ACT 14:26 Site nʼebe ahụ, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk bụ ebe a nọ nyefee ha nʼamara Chineke nʼihi ọrụ ndị a ha rụzuru.
ACT 14:27 Mgbe ha bịaruru, ha kpọkọtara nzukọ kọwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee, na otu o siri meghe ọnụ ụzọ nke okwukwe nye ndị mba ọzọ.
ACT 14:28 Ha na ndị na-eso ụzọ nọgidere nʼebe ahụ ruo oge dị anya.
ACT 15:1 Ụfọdụ ndị ikom sitere Judịa bịa malitere izi ụmụnna ozi, “Ọ bụrụ na e bighị unu ugwu dịka Mosis nyere nʼiwu, a pụghị ịzọpụta unu.”
ACT 15:2 Ha na Pọl na Banabas rụrịtara ụka nke ukwuu. Nʼihi nke a, ha kpebiri ka Pọl na Banabas, na ụfọdụ ndịisi ndị ọzọ soro gaa Jerusalem hụ ndị ozi na ndị okenye nke nzukọ maka okwu a.
ACT 15:3 Nzukọ ahụ zipụrụ ha nʼụzọ ha, mgbe ha sitere Fonisia na Sameria na-agafe, ha kọrọ otu ndị mba ọzọ siri chegharịa. Nke a wetara ndị niile kwere ekwe oke ọṅụ dị ukwuu.
ACT 15:4 Mgbe ha bịaruru Jerusalem, nzukọ, ndị ozi na ndị okenye nabatara ha, ha kọkwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee.
ACT 15:5 Ma ụfọdụ ndị kwere ekwe si nʼotu ndị Farisii biliri na-ekwu sị, “Na ọ dị mkpa ka e bie ha ugwu ma gwakwa ha ka ha dobe iwu Mosis.”
ACT 15:6 Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye zukọtara itule okwu a.
ACT 15:7 Mgbe ha nọ tulegide okwu ahụ ruo oge dị anya, Pita guzoro ọtọ sị ha, “Ụmụnna m, unu niile maara na site na mbụ Chineke họpụtara m site nʼetiti unu, ka m zisaa oziọma ahụ nye ndị mba ọzọ ka ha nụrụ, ma kwerekwa.
ACT 15:8 Chineke a, onye maara obi mmadụ niile gbaara ha akaebe site nʼinye ha onyinye Mmụọ Nsọ dịka anyị si nata ya na mbụ.
ACT 15:9 O gosighị na o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ha. Nʼihi na o mere ka obi ha dị ọcha site nʼokwukwe.
ACT 15:10 Ugbu a, gịnị mere unu ji anwa Chineke ọnwụnwa site na-itinye nʼolu ndị na-eso ụzọ ya ibu arọ nke anyị maọbụ nna nna anyị ha na-enweghị ike ịdọkpụ?
ACT 15:11 Mba, anyị kwenyere na ọ bụ site nʼamara nke Onyenwe anyị Jisọs ka a ga-eji zọpụta anyị, dịka a ga-esi zọpụtakwa ha.”
ACT 15:12 Mmadụ niile nọdụrụ nwayọọ, ha bidoro ige ntị nʼakụkọ Banabas na Pọl na-akọrọ ha banyere ihe ịrịbama niile na ọrụ ebube niile Chineke jiri ha rụọ nʼetiti ndị mba ọzọ.
ACT 15:13 Mgbe ha kwusiri okwu ndị a, Jemis sịrị, “Ụmụnna m geenụ ntị.
ACT 15:14 Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya.
ACT 15:15 Nke a na okwu ndị amụma dakọtara, dịka e dere ya,
ACT 15:16 “ ‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi, aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada. Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa, aga m emekwa ka ọ guzozie,
ACT 15:17 ka ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ nwe ike chọọ Onyenwe anyị, ọ bụladị ndị mba ọzọ niile ndị a kpọkwasịrị aha m, ka Onyenwe anyị kwuru, onye na-emekwa ihe ndị a.’
ACT 15:18 Nke a amaara site na mgbe ochie.
ACT 15:19 “Nʼihi nke a, mkpebi ikpe m bụ nke a, ka anyị ghara isogbu ndị mba ọzọ lọghachikwutere Chineke,
ACT 15:20 kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara.
ACT 15:21 Site na mbụ, Mosis nwere ndị na-ekwusa iwu nʼobodo niile. A na-agụkwa ya nʼụlọ nzukọ nʼụbọchị izuike niile.”
ACT 15:22 Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye, ha na nzukọ niile, kpebiri ka a họpụta ndị ikom a ga-eziga Antiọk ha na Pọl na Banabas. Ha họpụtara Judas onye a na-akpọkwa Basabas, na Saịlas, ndị ndu so nʼetiti ụmụnna.
ACT 15:23 Ha nyekwara ha nʼakwụkwọ ozi dị otu a, Akwụkwọ a sitere nʼaka ndị ozi, na ndị okenye ndị bụ ụmụnna unu. A na-edetara ya unu ndị sitere na mba ọzọ kwere bụ ndị nọ nʼAntiọk, Siria na Silisia. Ekele.
ACT 15:24 E mere ka anyị mata na ụfọdụ ndị otu anyị ebuterela unu nsogbu na ọgbaaghara, mee ka obi lọọ unu mmiri, na-emebi mkpụrụobi unu. Ma nʼezie, ha anataghị ike nʼaka anyị ime nke a.
ACT 15:25 Nʼihi nke a, anyị zukọrọ, sitekwa nʼotu obi kpebie ịhọpụta ụfọdụ ndị ikom na izitere unu ha, ha na ndị anyị hụrụ nʼanya, bụ Pọl na Banabas,
ACT 15:26 ndị ikom werela ndụ ha tụnye nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
ACT 15:27 Ya mere, anyị na-ezite Judas na Saịlas ndị ga-akọwara unu nʼihu nʼihu, ihe anyị dere nʼakwụkwọ a.
ACT 15:28 Nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi nʼanya Mmụọ Nsọ na nʼanya anyị kwa, na o kwesighị ka anyị bokwasị unu ibu arọ karịa ihe ndị a dị mkpa.
ACT 15:29 Ma o kwesiri ka unu hapụ iri ihe ọbụla e jiri chụọ aja nye arụsị, ya na iri anụ ọbụla a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. Kewapụkwanụ onwe unu site nʼịkwa iko. Ọ bụrụ na unu eme ihe ndị a, unu mere nke ọma. Nọọnụ nke ọma.
ACT 15:30 Ya mere, e zipụrụ ha, ha jeruokwa Antiọk. Mgbe ha kpọkọrọ nzukọ ahụ, ha nyere ha akwụkwọ ozi ahụ.
ACT 15:31 Mgbe ndị otu ọgbakọ ahụ gụsịrị ya, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu nʼihi agbamume ha natara.
ACT 15:32 Judas na Saịlas, ndị ha onwe ha bụ ndị amụma, kwuru ọtụtụ okwu, iji gbaa ha ume na ime ka okwukwe ndị kwere ekwe guzosie ike.
ACT 15:33 Mgbe ha nọnyesịrị ha nwa oge nta, ndị kwere ekwe ji ngọzị nke udo zilaga ha ka ha laghachikwuru ndị zitere ha.
ACT 15:34 Ma ọ masịrị Saịlas ịnọtukwu nʼebe ahụ.
ACT 15:35 Pọl na Banabas nọgidere nʼAntiọk, ebe ha na ndị ọzọ kuziri ihe ma kwusakwa okwu Onyenwe anyị.
ACT 15:36 Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Pọl gwara Banabas, “Ka anyị gaghachi nʼobodo niile anyị kwusara okwu Onyenwe anyị nʼotu nʼotu, mata ka ndị kwere ekwe si agbalị nʼebe ahụ.”
ACT 15:37 Banabas chọrọ ka ha na Jọn onye a na-akpọ Mak soro gaa.
ACT 15:38 Ma Pọl echeghị na o ziri ezi iduru ya nʼihi na ọ hapụrụ ha na Pamfilia. O sokwaghị ha jezuo ozi ha.
ACT 15:39 Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha siri ike nke mere na ha kewara. Banabas kpọrọ Jọn Mak banye nʼụgbọ gawa Saiprọs.
ACT 15:40 Ma Pọl họọrọ Saịlas, kpọrọ ya gawa njem, mgbe ụmụnna kpesịrị ha ekpere raara ha nye nʼamara Onyenwe anyị.
ACT 15:41 O jegharịrị nʼime obodo Siria na Silisia na-agba nzukọ nọ nʼebe ahụ ume.
ACT 16:1 Pọl bịaruru Debi na Listra, ebe otu onye na-eso ụzọ Jisọs a na-akpọ Timoti bi. Nne ya bụ onye Juu bụrụkwa onye kwere ekwe, ma nna ya bụ onye Griik.
ACT 16:2 Ụmụnna ndị bi na Listra na Aikoniọm gbara ezi ama banyere ya.
ACT 16:3 Pọl chọrọ ka Timoti soro ya nʼije ya. Ma nʼihi ndị Juu bi nʼakụkụ ebe ahụ, o biri ya ugwu nʼihi na mmadụ niile maara na nna ya bụ onye Griik.
ACT 16:4 Dịka ha na-eme njem site nʼobodo ruo nʼobodo, ha na-akọwara ha ihe banyere mkpebi ndị ozi na ndị okenye kpebiri na Jerusalem ka ha nwe ike idebe ha.
ACT 16:5 Ihe ndị a niile mere ka nzukọ sie ike nʼokwukwe ma baakwa ụba nʼọnụọgụgụ kwa ụbọchị.
ACT 16:6 Ha gara mpaghara Frigia na Galeshịa. Ma Mmụọ Nsọ ekweghị ka ha kwusaa oziọma nʼakụkụ Eshịa nʼoge ahụ.
ACT 16:7 Mgbe ha ruru nʼakụkụ obodo Misia, ha chere ihu ịbanye nʼakụkụ obodo Bitinia. Ma Mmụọ Nsọ nke Jisọs akwagideghị ka ha gaa.
ACT 16:8 Ka ha si nʼakụkụ Misia gafee, ha batara Troas.
ACT 16:9 Nʼabalị ahụ, Pọl hụrụ ọhụ ebe ọ hụrụ otu nwoke onye Masidonia ka o guzo na-arịọ ya sị, “Bịa na Masidonia nyere anyị aka.”
ACT 16:10 Mgbe ọ hụchara nke a, anyị jikeere ngwangwa ịga Masidonia ebe anyị mara na Chineke akpọọla anyị ịgbasara ha oziọma.
ACT 16:11 Anyị banyere ụgbọ mmiri na Troas sị ya gafee Samotres. Nʼechi ya, anyị bịaruru Niapolis.
ACT 16:12 Site nʼebe ahụ anyị jeruru Filipai nke bụ isi obodo dị nʼakụkụ mpaghara Masidonia bụrụkwa otu akụkụ nʼebe ndị Rom na-achị. Anyị nọdụrụ nʼime obodo a ọtụtụ ụbọchị.
ACT 16:13 Nʼụbọchị izuike, anyị sitere nʼobodo ahụ gaa nʼakụkụ osimiri ebe anyị chọpụtara na ụlọ ekpere dị. Nʼebe a ka anyị nọ gwa ụmụ nwanyị ndị gbakọrọnụ okwu.
ACT 16:14 Aha otu nʼime ndị inyom nụrụ okwu anyị bụ Lidia, onye obodo Tiatira, onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Onyenwe anyị meghere obi ya, ige ntị nʼihe Pọl na-ekwu.
ACT 16:15 Ka e mesịrị ya na ezinaụlọ ya baptizim, ọ rịọrọ anyị na-asị, “Ọ bụrụ nʼezie na unu gụrụ m dịka onye kwesiri ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, batanụ nʼụlọ m nọrọ.” Mgbe ọ kwagidesịrị anyị ike, anyị sooro ya.
ACT 16:16 Otu ụbọchị, mgbe anyị na-aga nʼụlọ ekpere, anyị zutere otu nwaagbọghọ bụ ohu, onye nwere mmụọ ịgba afa. Ọ na-ewetara ndị nwe ya ezigbo ego site nʼịgba afa.
ACT 16:17 Ma o sogidere anyị na Pọl ebe ọbụla anyị na-aga, na-eti mkpu na-asị, “Ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ha bịara ikwupụtara unu ihe banyere ụzọ nzọpụta.”
ACT 16:18 O mere nke a ọtụtụ ụbọchị. Ma site nʼoke iwe, Pọl baara mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime ya mba sị, “Eji m aha Jisọs Kraịst na-enye gị iwu sị gị site nʼime ya pụta!” Otu mgbe ahụ o siri nʼime ya pụta.
ACT 16:19 Mgbe ndị nwe ya hụrụ nʼolileanya ha iji inweta ego akwụsịla, ha jidere Pọl na Saịlas dọkpụrụ ha jekwuru ndịisi obodo nʼọma ahịa.
ACT 16:20 Mgbe ha dutara ha nʼihu ndị na-ekpe ikpe ha sịrị, “Ndị ikom a bụ ndị Juu ma ha etinyela ọgbaaghara nʼobodo anyị,
ACT 16:21 site nʼikuzi omenaala megidere iwu anyị, nke anyị bụ ndị Rom na-enweghị ike ịnabata maọbụ mee.”
ACT 16:22 Igwe mmadụ sonyere imegide ha. Ndị ikpe nyere iwu ka a dọwaa uwe, pịakwa ha ihe.
ACT 16:23 Mgbe ha pịachara ha ihe nke ọma, a tụnyere ha nʼime ụlọ mkpọrọ, nyekwa onye nche iwu ka o chee ha nke ọma.
ACT 16:24 Nʼihi nke a, o tinyere ha nʼime ime ụlọ mkpọrọ, ebe o jiri ọtọsị kegide ha nʼụkwụ.
ACT 16:25 Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị.
ACT 16:26 Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara.
ACT 16:27 Mgbe onyeisi nche ụlọ mkpọrọ tetara nʼụra ma hụ na ọnụ ụzọ niile ghere oghe. Nʼihi ya, o chere na ndị mkpọrọ niile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya.
ACT 16:28 Ma Pọl tiri mkpu nʼoke olu, sị, “Emerula onwe gị ahụ. Anyị niile nọ nʼebe a!”
ACT 16:29 Onyeisi nche ahụ kpọrọ ka eweta ọkụ, ọ gbabara nʼime, daa nʼụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji.
ACT 16:30 Ọ kpọpụtara ha nʼezi sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?”
ACT 16:31 Ha sịrị, “Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile.”
ACT 16:32 Mgbe ahụ, ha gwara ya na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya okwu nke Onyenwe anyị.
ACT 16:33 Nʼotu elekere ahụ, nʼabalị ahụ, ọ sachara ọnya ha. Nʼatụfughị oge, ha mere ya na ezinaụlọ ya baptizim.
ACT 16:34 Ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinaụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na o kwerela na Chineke.
ACT 16:35 Nʼechi ya, ndị ikpe ahụ zitere ndị uweojii sị, “Hapụnụ ụmụ nwoke ahụ ka ha laa.”
ACT 16:36 Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara Pọl, sị, “na ndị ikpe zitere ozi sị ha laa. Ugbu a pụtanụ. Unu laanụ nʼudo.”
ACT 16:37 Ma Pọl sịrị ha, “Ha tiri anyị ihe nʼihu mmadụ niile na-ebughị ụzọ kpee anyị ikpe. Emesịa ha tinyere anyị nʼụlọ mkpọrọ. Anyị bụ diala nʼobodo Rom! Olee otu ha ga-esi zipụ anyị na nzuzo. O kwesiri ka ha bịa nʼonwe ha kpọpụta anyị.”
ACT 16:38 Ndị uweojii ahụ gara gwa ndị ikpe ahụ ihe ha kwuru. Mgbe ha nụrụ na ha bụ diala na Rom, ha tụrụ egwu nke ukwuu.
ACT 16:39 Ha bịakwutere ha rịọsie ha arịrịọ ike. Ha kpọpụtakwara ha, rịọ ha ka ha hapụ obodo ahụ.
ACT 16:40 Mgbe ha sitere nʼụlọ mkpọrọ pụta, ha gara nʼụlọ Lidia. Nʼebe ahụ ka ha zutere ụmụnna, gwa ha okwu mgbamume, emesịa ha si nʼobodo ahụ pụọ.
ACT 17:1 Mgbe ha gafechara obodo Amfipolis na Apolonia, ha bịaruru obodo Tesalonaịka, ebe ụlọ nzukọ ndị Juu dị.
ACT 17:2 Pọl bakwuuru ha, dịka ọ na-eme oge niile. Ọ nọnyere ha izu ụka atọ, ya na ha na-atụgharị uche nʼAkwụkwọ Nsọ,
ACT 17:3 na-akọwara ha na-edokwa ha anya na ọ dị mkpa na Kraịst ga-ahụ ahụhụ, ma sitekwa nʼọnwụ bilie. Ọ sịrị, “Jisọs a, nke m na-ekwusara unu bụ Kraịst ahụ.”
ACT 17:4 Ụfọdụ nʼime ndị Juu ahụ ka e mere ka ha kwere ma sonyere Pọl na Saịlas, otu aka ahụ, igwe mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke nʼetiti ndị Griik na ụmụ nwanyị ụfọdụ a maara aha ha.
ACT 17:5 Ma ndị Juu jupụtara nʼekworo, nʼihi ya, ha kpaliri obi ụfọdụ mmadụ efu nʼetiti ha nʼọma ahịa. Ndị a malitekwara ọgbaaghara nʼụzọ dị iche nʼime obodo. Ha tikasịrị ụlọ Jesin, nʼihi na ha chọrọ ịdọpụta ha nyefee ha nʼaka ọha mmadụ.
ACT 17:6 Ma mgbe ha na-achọtaghị ha nʼebe ahụ, ha dọpụtara Jesin na ụmụnna anyị ụfọdụ, duru ha jekwuru ndị ikpe nke obodo ahụ, na-eti mkpu, “Ndị a kpuru ụwa ihu nʼala abịala inye obodo ukwu anyị nsogbu.
ACT 17:7 Ma Jesin nabatara ha nʼụlọ ya. Ha na-emebi iwu Siza nʼihi na ha na-asịkwa na ọ dị eze ọzọ dị nke a na-akpọ Jisọs.”
ACT 17:8 Okwu dị otu a wetara obi ịlọ mmiri nʼetiti ndị ikpe na mmadụ niile.
ACT 17:9 Ha hapụrụ Jesin na ndị ọzọ, naanị mgbe ndị akaebe bịara kwụọ ụgwọ e jiri gbapụta ha.
ACT 17:10 Ma nʼabalị ahụ, ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl na Saịlas ka ha gaa obodo Beria. Ma mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu.
ACT 17:11 Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu a karịa ndị bi na Tesalonaịka. Nʼihi na ha ji ịnụ ọkụ nʼobi nara okwu ahụ, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị, ka ha mara ma ihe ha na-ekwu ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị niile.
ACT 17:12 Ọtụtụ nʼime ha kweere, ụfọdụ ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke ndị Griik a maara aha ha chegharịkwara.
ACT 17:13 Ma mgbe ndị Juu bi na Tesalonaịka nụrụ na Pọl na-ekwusa oziọma Chineke na obodo Beria, ụfọdụ ha gara nʼebe ahụ na-akpali igwe ndị mmadụ nʼihi iwebata ọgbaaghara.
ACT 17:14 Ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl ka ọ gaa nʼakụkụ oke osimiri dị nʼebe ahụ. Ma ha hapụrụ Saịlas na Timoti ka ha na ha nọdụ.
ACT 17:15 Ma ndị dupuru Pọl sooro ya ruo obodo Atens. Ha lawara, hapụrụ Saịlas na Timoti ozi ka ha bịakwute ya na-atụfughị oge.
ACT 17:16 Mgbe Pọl nọ na-echere ha nʼAtens, o wutere mmụọ ya nke ukwuu nʼihi arụsị niile ọ hụrụ, nke jupụtara nʼobodo ahụ.
ACT 17:17 Nʼihi nke a, ya na ndị Juu na ndị na-atụ egwu Chineke, na-anọgide nʼụlọ nzukọ na-arụrịta ụka. Kwa ụbọchị, ọ na-apụkwa nʼọma ahịa na-agwa ndị niile o zutere okwu.
ACT 17:18 Ya na ụfọdụ ndị Epikuri na ndị Stoịk bụ ndị ọkachamara na-arụrịta ụka. Ndị ụfọdụ na-asị, “gịnị ka onye ekwurekwu a ga-ekwu?” Ndị ọzọ sịrị, “ọ dịka onye na-ekwusa ụmụ mmụọ ndị ala ọzọ.” Ha kwuru nke a nʼihi na ọ na-ekwusa oziọma banyere Jisọs na mbilite nʼọnwụ ya.
ACT 17:19 Ha kpọbatara ya nʼebe ha zukọrọ, ebe a na-akpọ Areopagọs, ebe ha nọ sị ya, “Anyị enwere ike ịmata ihe banyere ozizi ọhụrụ gị a?
ACT 17:20 Ị na-ekwu ihe ndị na-agbagwoju anyị anya. Anyị chọrọ ịmata ihe ndị a nke ọma.”
ACT 17:21 (Ndị Atens niile na ndị ala ọzọ bi nʼobodo ahụ, enweghị ohere ime ihe ọbụla, ọ gwụchaala ọrụ ikwu na ịnụ banyere ihe dị ọhụrụ.)
ACT 17:22 Mgbe ahụ Pọl guzoro na nzukọ Areopagọs sị, “Unu ndị Atens, ahụla m na ọ na-anụ unu ọkụ nʼobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe.
ACT 17:23 Nʼihi na mgbe m na-ejegharị nʼobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja nke e dekwasịrị nʼelu ya: Ihe e nyere chi nke amaghị ama. Ya mere, ihe ahụ unu na-efe ofufe nʼamaghị ama nke a ka m na-ekwusara unu.
ACT 17:24 “Chineke onye kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nʼụlọnsọ e jiri aka wuo.
ACT 17:25 Otu aka ahụ, ọ dịghị anara ije ozi site nʼaka mmadụ, dịka a ga-asị na o nwere ihe kọrọ ya. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe niile. Ọ na-egbokwa mkpa niile.
ACT 17:26 O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha.
ACT 17:27 Ma nzube ya banyere ihe niile bụ ka onye ọbụla chọsie Chineke ike. Eleghị anya, mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta ya. Ọ nọkwaghị mmadụ ọbụla nʼebe dị anya.
ACT 17:28 ‘Nʼihi nʼime ya ka anyị na-ebi, anyị na-ejegharịkwa nʼime ya na-adịkwa ndụ.’ Dịka ụfọdụ nʼime unu ndị ode abụ na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụ ụmụ ya.’
ACT 17:29 “Ebe anyị bụ ndị Chineke mụrụ, o kwesighị ka anyị na-eche na ihe akpọrọ Chineke yiri ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ nkume, ihe apịrị apị site na ǹka na ihe dị nʼobi mmadụ.
ACT 17:30 Ma Chineke lefuru enweghị nghọta nke mmadụ anya banyere ihe ndị a niile nʼoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.
ACT 17:31 Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke ọ họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie.”
ACT 17:32 Mgbe ha nụrụ ihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nʼoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.”
ACT 17:33 Nʼoge a, Pọl hapụrụ ha.
ACT 17:34 Mmadụ ole na ole sooro ya, bụrụkwa ndị kwere ekwe. Otu onye nʼime ha bụ Dionisiọs onye Areopagọs. Onye ọzọ bụ nwanyị a na-akpọ Damaris na ndị ọzọkwa.
ACT 18:1 Ka nke a mechara, Pọl hapụrụ Atens gaa Kọrint.
ACT 18:2 Nʼebe ahụ o zutere otu onye Juu a mụrụ nʼobodo Pọntọs, onye a na-akpọ Akwila. Ya na nwunye ya Prisila sitere Itali Klọdiọs nyere iwu ka a chụpụ ndị Juu site nʼobodo Rom. Pọl gara hụ ha,
ACT 18:3 nʼihi na ha na-arụ otu ọrụ, o binyere ha, sokwara ha rụkọọ ọrụ nʼihi na ha bụ ndị na-akpa akwa e ji ama ụlọ ikwu.
ACT 18:4 Ụbọchị izuike niile, ọ na-arụ ụka nʼụlọ nzukọ ha na-agbalị ime ka ndị Juu na ndị Griik kwere.
ACT 18:5 Mgbe Saịlas na Timoti sitere na Masidonia bịa, Pọl tinyere oge ya niile ikwusa okwu na ịkọwara ndị Juu na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
ACT 18:6 Mgbe ọbụla ha megidere ya ma kparịa ya, ọ na-efecha uwe ya, sị ha, “Ọbara unu dị unu nʼisi, aka m dị ọcha. Malite ugbu a, aga m agakwuru ndị mba ọzọ.”
ACT 18:7 O siri nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Taịtọs Jọstus, onye na-asọpụrụ na-efekwa Chineke ofufe. Ụlọ ya dị nso nʼụlọ nzukọ ndị Juu.
ACT 18:8 Krispọs onyeisi nʼụlọ nzukọ ahụ na ezinaụlọ ya niile kweere nʼOnyenwe anyị. Ọtụtụ ndị ọzọ bi na Kọrint nụrụ okwu ahụ, kwere, e mee ha baptizim.
ACT 18:9 Onyenwe anyị gwara Pọl nʼọhụ nʼotu abalị sị, “Atụla egwu, kwusie okwu ike, emechikwala ọnụ gị.
ACT 18:10 Nʼihi na anọnyeere m gị. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ imerụ gị ahụ. Enwekwara m ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a.”
ACT 18:11 Ọ nọgidere ebe ahụ otu afọ na ọkara. Ọ na-ezikwa ndị mmadụ okwu Chineke.
ACT 18:12 Mgbe Galio malitere ịchị achị nʼobodo Akaịa, ndị Juu bidoro omume ọjọọ megide Pọl. Nʼikpeazụ, ha dupụtara ya, gaa nʼụlọikpe.
ACT 18:13 Ha sịrị, “Nwoke a na-amanye ndị mmadụ ka ha na-ekpere Chineke nʼụzọ megidere iwu.”
ACT 18:14 Ma mgbe Pọl chọrọ ikwu okwu, Galio sịrị ndị Juu ahụ, “Agaara m enwe ndidi gee unu ntị ma ọ bụrụ na okwu a gbasara mmejọ mmadụ mejọrọ ibe ya, maọbụ arụ mmadụ mere megide obodo.
ACT 18:15 Ma ebe unu na-ekwu ihe banyere okwu na aha dị iche iche nakwa iwu unu, gaanụ dozie ya nʼonwe unu. Agaghị m abụ onye ikpe okwu ihe ndị dị otu a.”
ACT 18:16 O sitere nʼime ụlọ ikpe ya chụpụ ha.
ACT 18:17 Ha jidere Sostenis, onye bụ onyeisi ụlọ nzukọ ahụ tie ya ihe nke ukwuu nʼọnụ ụzọ ụlọ ikpe ahụ. Ma Galio emeghị dịka ọ maara ihe na-eme nʼebe ahụ.
ACT 18:18 Mgbe ọ nọsịrị nʼebe ahụ ọtụtụ ụbọchị, Pọl sịrị ndị kwere ekwe nọ nʼebe ahụ ka ha nọdụnụ nke ọma, ma si nʼebe ahụ banye nʼụgbọ mmiri ruo Siria. Prisila na Akwila sokwaara ya gaa. Nʼobodo a na-akpọ Senkria, ọ kpụchara agịrị isi ya, nʼihi nkwa o kwere.
ACT 18:19 Mgbe ha rutere Efesọs, ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ, ma o bu ụzọ banye nʼụlọ nzukọ ebe ya na ndị Juu nwere mkparịta ụka.
ACT 18:20 Ma mgbe ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụkwuoro ha ogologo oge, ọ kweghị.
ACT 18:21 Mgbe ọ na-ahapụ, ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na Chineke kwe, aga m alọghachikwute unu ọzọ.” Emesịa ọ banyere nʼụgbọ hapụ Efesọs.
ACT 18:22 Mgbe ọ kwụsịrị na Sizaria, ọ gara leta chọọchị dị nʼebe ahụ kelee ha. Emesịa, ọ gara nʼihu ruo Antiọk.
ACT 18:23 Mgbe ọ nọsịrị nwa oge nta nʼebe ahụ, ọ sitere nʼebe ahụ pụọ jegharịa nʼakụkụ obodo Galeshịa na Frigia na-agba ndị na-eso ụzọ ahụ ume.
ACT 18:24 Ma otu nwoke onye Juu, aha ya bụ Apọlọs, onye Alegzandria bịara na Efesọs. Ọ bụ onye ọka okwu, bụrụkwa onye maara ihe edere nʼAkwụkwọ Nsọ nke ọma.
ACT 18:25 Nwoke a natara ozizi banyere ụzọ Onyenwe anyị. O sitekwara nʼịnụ ọkụ nke obi kuzie nnọọ ihe ziri ezi banyere Jisọs. Ma ihe ọ maara bụ naanị ihe gbasara baptizim Jọn mere.
ACT 18:26 Ma ọ nọgidesịrị ike na-ekwuwa okwu nʼụlọ nzukọ. Mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwu ya, ha jekwuru ya, duru ya gaa nʼụlọ, were nwayọọ kọwaara ya ihe niile banyere ụzọ Chineke.
ACT 18:27 Mgbe o zubere ịga obodo Akaịa, ndị ụmụnna gbara ya ume. Ha degaara ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ akwụkwọ ka ha nabata ya. Mgbe ọ bịaruru, Onyenwe anyị sitere nʼaka ya mee ka amara ya baa ụba nʼebe ndị kwere ekwe nọ.
ACT 18:28 Nʼihi na nʼihu ndị mmadụ niile, o guzoro kwuo okwu megide ozizi ọjọọ na ịrụ ụka niile nke ndị Juu. O gosiri ha site nʼakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
ACT 19:1 Mgbe Apọlọs nọ na Kọrint, Pọl sitere ụzọ nke nʼime elu ala bịarute Efesọs. Nʼebe ahụ, ọ hụrụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ,
ACT 19:2 sị ha, “Unu natakwara Mmụọ Nsọ mgbe unu kweere?” Ha sịrị ya, “Mba, anyị anụbeghị na ọ nwere ihe dịka Mmụọ Nsọ.”
ACT 19:3 Ya mere, ọ sịrị, “Gịnị ka unu kwenyere nʼime ya mgbe e mere unu baptizim?” Ha sịrị, “Baptizim nke Jọn.”
ACT 19:4 Mgbe ahụ, Pọl sịrị, “Baptizim Jọn bụ nke gbasara nchegharị site na mmehie, na-agwa ndị mmadụ ka ha kwere nʼonye ahụ na-eso ya na-abịa, nke bụ, ikwere nʼime Jisọs.”
ACT 19:5 Mgbe ha nụrụ nke a, e mere ha baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs.
ACT 19:6 Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nʼasụsụ dị iche iche, bukwaa amụma.
ACT 19:7 Ha niile ruru ndị ikom iri na abụọ.
ACT 19:8 Ọ banyere nʼụlọ nzukọ ahụ ma were nkwuwa okwu, na ịrụ ụka nʼebe o doro anya gwasie ha okwu ike banyere alaeze Chineke. Ọ bụ ọnwa atọ ka o were ya ime nke a.
ACT 19:9 Ma ụfọdụ nʼime ha mechiri obi ha; ha juru ikwenye, kama ha kwuru okwu ọjọọ megide Ụzọ ahụ nʼihu ọgbakọ ahụ niile. Ya mere, o sitere nʼebe ha nọ pụọ, kpọrọkwa ndị na-eso ụzọ ahụ, ha na-akparịta ụka kwa ụbọchị nʼụlọ ọgbakọ Tiranọs.
ACT 19:10 Ihe ndị a gakwara nʼihu afọ abụọ. Ndị niile bi na Eshịa nụkwara oziọma Onyenwe anyị. Ọtụtụ nʼime ha bụ ndị Juu, ma ndị ọzọ bụ ndị Griik.
ACT 19:11 Chineke sitere nʼaka Pọl rụọ ọtụtụ ọrụ ebube pụrụ iche.
ACT 19:12 Nke bụ na-ewere ụfọdụ nʼime akịsị maọbụ ịchafọ na akwa mgbochi nke metụrụ ya nʼahụ na-atụkwasị nʼahụ ndị ọrịa, ahụ a dịkwa ha ike. E sitekwara na ya chụpụ mmụọ ọjọọ.
ACT 19:13 Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nʼaha Onyenwe anyị Jisọs na-asị, “E ji m aha Jisọs, onye Pọl na-ekwusa na-enye unu iwu ka unu site nʼime ya pụta.”
ACT 19:14 Ndị na-eme ihe dị otu a bụ ụmụ asaa nke Skiva, onyeisi nchụaja, bụ onye Juu.
ACT 19:15 Mmụọ ọjọọ ahụ zara ha sị, “Amaara m onye Jisọs bụ, amakwaara m onye Pọl bụ, ma unu onwe unu, unu bụ ndị ole?”
ACT 19:16 Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị makwasịrị ha, tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbara ọtọ gbapụ nʼụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ.
ACT 19:17 Akụkọ banyere ihe ndị a jezuru obodo Efesọs niile. Mgbe ahụ, ndị Juu na ndị Griik ụfọdụ nụkwara ihe ndị a. Oke egwu jidekwara ha. Nʼihi nke a, e mekwara ka aha Onyenwe anyị Jisọs daa ụda nʼebe niile.
ACT 19:18 Ọtụtụ ndị kwenyerenụ bịara na-ekwupụta omume ọjọọ ha niile, nʼihu mmadụ niile.
ACT 19:19 Ọtụtụ nʼime ndị na-agwọ ọgwụ mgbaasị bupụtara akwụkwọ niile ha ji na-eme mgbaasị, kpọọ ha ọkụ nʼihu mmadụ niile. Akwụkwọ niile a kpọrọ ọkụ nʼụbọchị ahụ ga-eru ego ruru puku ọlaọcha iri ise.
ACT 19:20 Ya mere, okwu Onyenwe anyị toro, na-agbasa nʼike nʼike na-adịkwa ire.
ACT 19:21 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Pọl kpebiri nʼime mmụọ ya na ya ga-eje ruo Masidonia na Akaịa tupu ọ bịaruo Jerusalem. O sịkwara “na ya aghaghị ijeru Rom nʼọgwụgwụ ije ya niile.”
ACT 19:22 O zipụrụ ndị na-enyere ya aka, bụ Timoti na Erastọs ka ha buru ụzọ jeruo Masidonia. Ma ya onwe ya nọgidere nʼime Eshịa nwa oge.
ACT 19:23 Ma ọ bụ nʼoge a ka oke nsogbu malitere megide Ụzọ ahụ.
ACT 19:24 Otu onye ụzụ na-agbaze ọlaọcha, aha ya bụ Dimitriọs, onye ji ọlaọcha na-akpụ ụlọ arụsị ala ahụ a na-akpọ Atemis. Ọ na-ewetara ya na ndị ụzụ ibe ya ego nʼebe o hiri nne.
ACT 19:25 Nwoke a kpọkọtara ndị ọrụ ya niile, na ndị ya na ha na-arụkọ otu ọrụ, sị, “Ndị ibe m, unu ma na ọ bụ site nʼọrụ nke a ka anyị si enweta akụnụba anyị.
ACT 19:26 Unu niile ahụla ma nụkwa, otu nwoke a na-akpọ Pọl si rafuo ọtụtụ ndị mmadụ site nʼime ka ha kwenye na chi ọbụla e ji aka mee abụghị chi. Ọ bụkwaghị naanị nʼEfesọs kama ọ fọdụrụ ihe nta ka ọ bụrụ nʼEshịa niile.
ACT 19:27 Ọ bụkwaghị naanị na ihe ize ndụ dị banyere ọrụ aka anyị nke a ga elelị kama tinyere nke a, ụlọ nke oke chi nwanyị bụ Atemis agaghị enwekwa nsọpụrụ. Ya bụ, chi nwanyị nʼonwe ya bụ onye a na-efe nʼobodo Eshịa niile nakwa nʼelu ụwa niile ka a ga-anapụ nkwanye ugwu dịrị ya dịka chi.”
ACT 19:28 Ma mgbe ha nụrụ ihe ndị a, ha were oke iwe tie mkpu na-asị, “Atemis ndị Efesọs dị ukwuu!”
ACT 19:29 Ọgbaaghara ahụ gbasara, zuo obodo ahụ niile. Ha banyere nʼebe a na-eme ihe ileleanya, kpọpụta Gaiọs na Arịstakọs ndị Masidonia, bụ ndị ha na Pọl na-arụkọ ọrụ.
ACT 19:30 Pọl chọrọ ịbakwuru igwe mmadụ ahụ, ma ndị na-eso ụzọ ahụ ekweghị ya.
ACT 19:31 Otu aka ahụ kwa, ụfọdụ ndị enyi ya nʼetiti ndị na-achị Eshịa zigakwaara ya ozi na-arịọ ya ka ọ hapụ ịbanye nʼebe ahụ a na-eme ihe ileleanya.
ACT 19:32 Ugbu a, nzukọ ahụ na-agba aghara, ụfọdụ mmadụ na-eti mkpu otu ihe, ndị ọzọ na-eti ihe ọzọ. Nʼezie, ọtụtụ nʼime ha amatakwaghị ihe ha jiri nọdụ nʼebe ahụ.
ACT 19:33 Ụfọdụ ndị Juu nʼime ọgbakọ ahụ nupuru Alegzanda, sepụta ya, mee ka o buru ụzọ. Alegzanda feere ha aka ka ha dere duu mgbe ọ chọrọ ịgọrọ onwe ya nʼihu ọha mmadụ ahụ.
ACT 19:34 Ma nʼotu ntabi anya ahụ, mgbe ha matara na ọ bụ onye Juu, ha bidoro iti mkpu ihe dịka ogologo awa abụọ na-asị, “Atemis ndị Efesọs dị ukwuu!”
ACT 19:35 Nʼikpeazụ, ode akwụkwọ nke obodo ahụ kwụsịrị igwe mmadụ ahụ ime ụzụ. O kwuru, “Ndị ikom Efesọs, o nwere onye na-amaghị na obodo Efesọs bụ obodo na-echekwa ụlọ ofufe Atemis, na oyiyi ya nke si nʼeluigwe daa?
ACT 19:36 Ebe ihe ndị a adịghị na ngọpụ, ọ dị mkpa ka unu nọdụ nwayọọ, ghara imebi ihe ọbụla nʼecheghị echiche.
ACT 19:37 Lee ugbu a, ndị a unu kpọtara nʼebe a abụghị ndị ohi, ndị na-ezuru ihe nʼogige chi anyị, maọbụ na-ekwutọ eze nwanyị arụsị anyị.
ACT 19:38 Ọ bụrụ na Dimitriọs na ndị ọkpụ ụzụ ibe ya nwere ihe ọbụla megide ha, ha gaa nʼụlọikpe. Ndị na-ekpe ikpe ga-eleba okwu ha anya. Kama ha mee ya nʼusoro iwu kwadoro.
ACT 19:39 Ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọzọ dị iche unu chọrọ ka e mee, a ga-edozi ya na nzukọ nke ndị obodo na-eme nʼụzọ ziri ezi.
ACT 19:40 Nʼihi na egwu dị, na-eleghị anya a ga-eji ihe nke mere taa boo anyị ebubo na anyị na-ebute ọgbaaghara. Anyị enweghị ọsịsa ziri ezi banyere ọgbaaghara nke a.”
ACT 19:41 Mgbe o kwuchara nke a, ọ gbasara ha.
ACT 20:1 Mgbe ọgbaaghara ndị a kwụsịrị, Pọl kpọkwara ndị na-eso ụzọ ahụ, gbaa ha ume, gwa ha ka ha nọdụ nke ọma, ọ pụrụ gawa Masidonia.
ACT 20:2 Mgbe ọ gagharịchara nʼakụkụ ala ahụ niile, werekwa okwu nkasiobi gbaa ndị ụmụnna ume, ọ bịaruru ala Griis.
ACT 20:3 Ọ nọrọ ọnwa atọ nʼebe ahụ. Mgbe ọ chọpụtara na ndị Juu agbaala ajọ izu megide ya dịka ọ na-ejikere iso ụgbọ mmiri gaa Siria, o kpebiri ka ya si ụzọ Masidonia laghachi.
ACT 20:4 Sopata onye Boria bụ ọkpara Pirọs, na Arịstakọs, na Sekundus ndị si na Tesalonaịka, na Gaiọs onye Debi na Timoti, na Taịkikọs na Trofimọs, ndị Eshịa sokwa ya na-aga ije a.
ACT 20:5 Ndị a bu ụzọ gawa, na-eche anyị na Troas.
ACT 20:6 Mgbe Mmemme Ngabiga ahụ gwụsịrị, anyị banyere ụgbọ mmiri rute Filipai bịakwute ha na Troas nʼụbọchị nke ise. Anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị asaa.
ACT 20:7 Nʼụbọchị mbụ nʼizu ụka, mgbe anyị zukọrọ ịnyawa achịcha, Pọl gwara ha okwu, ebe ọ na-akwado ịla ma chi bọọ, o kwugidere okwu ruo nʼetiti abalị.
ACT 20:8 Ọtụtụ oriọna dịkwa nʼime ọnụụlọ ahụ dị nʼụlọ elu ebe anyị zukọrọ.
ACT 20:9 Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ.
ACT 20:10 Pọl rituru nʼala selite ya elu jikụọ ya. Ọ sịrị ndị gbakọrọ nʼebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.”
ACT 20:11 Ọ laghachikwara nʼụlọ elu ahụ, mgbe ọ nyawachara achịcha ma riekwa, o kwugidere okwu tutu chi abọọ, ọ hapụrụ ha bilie ije ya.
ACT 20:12 Ha kulitere nwokorobịa ahụ na ndụ nke mere ka ọṅụ jupụta ha nʼobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu.
ACT 20:13 Anyị onwe anyị gara nʼihu banye nʼụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ebe anyị zubere iburu Pọl nʼụgbọ anyị. O soghị anyị nʼihi na o zubere iji ụkwụ ruo ebe ahụ.
ACT 20:14 Mgbe o zutere anyị nʼAsọs, anyị buru ya nʼụgbọ gaa Mitilen.
ACT 20:15 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Kiọs, nʼụbọchị nke so ya, anyị gafere rute Samọs. Ma mgbe otu ụbọchị ọzọ gasịrị, anyị rutere Melitọs.
ACT 20:16 Nʼoge a, Pọl kpebiri na ọ gaghị akwụsị nʼEfesọs ka ọ ghara itufu oge nʼEshịa, nʼihi na ọ na-eme ngwangwa irute Jerusalem nʼụbọchị mmemme Pentikọọsụ, ma ọ bụrụ ihe ọ pụrụ ime.
ACT 20:17 Site na Melitọs, ọ zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị nke Efesọs ka ha bịa zute ya.
ACT 20:18 Oge ha bịakwutere ya, ọ gwara ha, “Unu maara nke ọma otu m si nọ nʼetiti unu mgbe niile mụ na unu nọrọ, site nʼụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nʼala Eshịa tutu ruo ugbu a.
ACT 20:19 Arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nʼobi umeala na anya mmiri nʼetiti ntaramahụhụ dị ukwuu, site nʼizu ọjọọ ndị Juu gbara maka m.
ACT 20:20 Unu hụrụ na m ahapụghị ime ka unu mara ihe ọbụla ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na-akụziri unu ihe nʼụlọ maọbụ nʼihu ọha.
ACT 20:21 E kwusaala m nye ma ndị Juu ma ndị Griik okwu nchegharị nʼebe Chineke nọ, na okwukwe nʼebe Onyenwe anyị Jisọs nọ.
ACT 20:22 “Ma otu ọ dị, ana m aga Jerusalem dịka iwu Mmụọ Nsọ nyere m si dị, ma amaghị m ihe ọnọdụ m ga-abụ nʼebe ahụ.
ACT 20:23 Karịakwa na Mmụọ Nsọ na-agbara m ama nʼebe ọbụla na mkpọrọ na ntaramahụhụ na-eche m nʼebe ahụ.
ACT 20:24 Ma akpọghị m ndụ m ihe ọbụla. Karịa naanị ka m gbazuo ọsọ m ma jezuokwa ozi ahụ m natara nʼaka Onyenwe anyị Jisọs, nke bụ ịkọwa banyere oziọma nke amara Chineke.
ACT 20:25 “Ma ugbu a, amaara m na o nweghị onye ọbụla nʼime unu, bụ ndị m jegharịrị nʼetiti ha na-ezisara ihe banyere alaeze a ga-ahụ m anya ọzọ.
ACT 20:26 Ya mere, ana m agwasị unu ike, taa, na abụ m onye aka ya dị ọcha nʼebe ọbara onye ọbụla nʼime unu dị.
ACT 20:27 Nʼihi na-esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu.
ACT 20:28 Ma ugbu a, kpacharanụ anya! Leziekwanụ onwe unu na igwe atụrụ nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta anya ya. Ka unu bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nke chọọchị Chineke, bụ nke o ji ọbara ya zụtara onwe ya.
ACT 20:29 Nʼihi na amaara m na mgbe m lachara, agụ jọgburu onwe ya ga-abata nʼetiti unu nke na-agaghị emere igwe atụrụ ebere.
ACT 20:30 Ụfọdụ nʼime unu ga-ebili tụgharịa eziokwu ahụ ịhụ ka ha si otu a dọrọ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ nye onwe ha.
ACT 20:31 Ya mere, na-echenụ nche! Chetakwanụ na nʼime afọ atọ m nọrọ nʼetiti unu, ehihie na abalị, eji m ịkwa akwa na anya mmiri na-adụ unu ọdụ.
ACT 20:32 “Ugbu a ana m etife unu nʼaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nʼaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu ume na inyekwa unu akụnụba ọ kwadobeere ndị ahụ e doro nsọ.
ACT 20:33 Ọ dịghị mgbe ọbụla agụụ ịdọtara onwe m ọlaọcha maọbụ ọlaedo maọbụ uwe nke onye ọbụla ji gụọ m.
ACT 20:34 Ọ bakwaghị uru ịgwa unu na ọ bụ aka m rụpụtara ọrụ gbooro m mkpa niile, na nke gbokwara mkpa ndị ahụ mụ na ha so.
ACT 20:35 Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’ ”
ACT 20:36 Mgbe o kwusiri okwu ndị a, o soro ha niile gbuo ikpere nʼala kpekwa ekpere.
ACT 20:37 Ha bere akwa nke ukwuu, makụọ Pọl, sutukwa ya ọnụ.
ACT 20:38 O wutere ha karịa na o kwuru na ha agaghị ahụ ya anya ọzọ. Emesịa, ha duru ya ruo ebe ọ banyere ụgbọ mmiri.
ACT 21:1 Mgbe anyị hapụsịrị ha, anyị nyapụrụ ụgbọ anyị bịaruo Kos. Nʼechi ya, anyị rutere Rods. Anyị sitere nʼebe ahụ jeruo Patara.
ACT 21:2 Mgbe anyị hụrụ ụgbọ mmiri na-aga Fonisia, anyị banyere nʼime ya kwọpụ.
ACT 21:3 Mgbe anyị kwọruru ụgbọ anyị ebe anyị nwere ike ịhụ Saiprọs, anyị siri nʼaka ekpe ya gafee, ruo Siria. Anyị rutere nʼọnụ mmiri Taịa, ebe ụgbọ mmiri ga-akwapụ ibu dị nʼime ya.
ACT 21:4 Mgbe anyị chọtara ndị na-eso ụzọ ahụ, anyị nọnyere ha abalị asaa. Ha gwara Pọl site nʼike nke Mmụọ Nsọ, ka ọ ghara ịga Jerusalem.
ACT 21:5 Mgbe anyị nọzuru ụbọchị anyị, anyị hapụrụ ha, bilie ije. Ha na nwunye ha na ụmụ ha so dupu ruo mgbe anyị si nʼobodo ahụ pụọ. Anyị na ha gburu ikpere nʼala nʼọnụ mmiri kpee ekpere.
ACT 21:6 Mgbe ahụ, anyị kelere onwe anyị ekele ikpeazụ. Emesịa, anyị banyere nʼime ụgbọ, ma ha laghachiri azụ nʼụlọ ha.
ACT 21:7 Mgbe anyị hapụrụ Taịa, anyị kwụsịrị na Tolomas. Nʼebe a anyị kelekwara ndị kwere ekwe nọ nʼime obodo a, nọnyere ha naanị otu ụbọchị.
ACT 21:8 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nʼihu nʼije anyị rute Sizaria. Nʼebe ahụ, anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ Filip onye na-agbasa oziọma. Ọ bụ otu nʼime mmadụ asaa ahụ.
ACT 21:9 O nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị na-alụbeghị di. Ha nwekwara onyinye ibu amụma.
ACT 21:10 Mgbe anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, ka otu onye amụma a na-akpọ Agabọs, si Judịa bata.
ACT 21:11 Ọ bịakwutere anyị, chilite belịt Pọl na-eke nʼukwu, kee onwe ya nʼụkwụ na aka sị, “Dịka Mmụọ Nsọ kwuru, ‘otu a ka ndị ndu ndị Juu ga-eke onye nwe ihe a agbụ na Jerusalem. Ha ga-ararakwa ya nye nʼaka ndị mba ọzọ.’ ”
ACT 21:12 Mgbe anyị nụrụ nke a, anyị na ndị niile nọ nʼebe ahụ rịọrọ Pọl ka ọ ghara ịga Jerusalem.
ACT 21:13 Ma Pọl zaghachiri, “Gịnị ka unu na-eme, ọ bụ akwa ka unu na-ebe, na-eme ka obi gbawaa m? Nʼihi na ọ bụghị naanị na m dị njikere ka e kee m agbụ, kama ejikekwara m iwere ndụ m nye na Jerusalem nʼihi aha Onyenwe anyị Jisọs.”
ACT 21:14 Ebe ọ na-ekweghị ege anyị ntị, anyị kwụsịrị ma sị, “Ka e mee uche Onyenwe anyị.”
ACT 21:15 Mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, anyị jikere bilie ịga Jerusalem.
ACT 21:16 Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ ndị nọ na Sizaria, duuru anyị gaa, ha kpọruru anyị nʼụlọ Mnasin, onye Saiprọs ebe anyị ga-anọ dịka ọbịa, onye sitere na mbụ bụrụ onye na-eso ụzọ ahụ.
ACT 21:17 Mgbe anyị rutere Jerusalem, ndị ụmụnna jiri obi ụtọ nabata anyị.
ACT 21:18 Nʼụbọchị nke so ya, anyị na Pọl gara ileta Jemis, ndị okenye niile nọkwa nʼebe ahụ.
ACT 21:19 Mgbe o kelechara ha, ọ kọọrọ ha nʼotu nʼotu, ihe niile Chineke rụrụ nʼetiti ndị mba ọzọ site nʼije ozi ya.
ACT 21:20 Mgbe ha nụchara nke a, ha nyere Chineke otuto. Emesịa, ha sịrị Pọl, “Leenụ nwanna, otu ọtụtụ puku ndị Juu si bụrụ ndị kwere ekwe, ha niile ka ihe banyere iwu a na-anụ ọkụ nʼobi.
ACT 21:21 A kọọrọla ha ihe banyere gị, na ị na-ezi ndị Juu bi nʼetiti ndị mba ọzọ ka ha hapụ ịgbasokwa iwu Mosis, na ka ha kwụsịkwa ibi ụmụ ha ugwu maọbụ bie ndụ nʼusoro omenaala anyị.
ACT 21:22 Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? O doro anya na ha ga-amata na ị bịara nʼebe a.
ACT 21:23 Ya bụ, jisie ike mee ihe anyị ga-agwa gị ugbu a. Anyị nwere mmadụ anọ nʼebe a, ndị nọ na nkwa ha kwere Chineke.
ACT 21:24 Soro ha mee omenaala ahụ nke ndị nọ na nkwa ji edo onwe ha ọcha. Kwụọrọ ha ụgwọ maka ịkpụcha isi ha. I mee otu a, mmadụ niile ga-amata na eziokwu adịghị nʼihe ndị a niile e kwuru maka gị, kama na gị onwe gị na-agazi ma na-edebekwa iwu.
ACT 21:25 Ma nʼebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ha kwụsị iri ihe ọbụla a chụrụ nʼaja nye arụsị, na iri ọbara, maọbụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.”
ACT 21:26 Pọl kpọọrọ ndị ikom anọ ndị ahụ tinyere onwe ya, nʼụbọchị so ya mee ka ya na ha dị ọcha. Mgbe ahụ, ọ banyere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, maka ikwupụta ụbọchị ole mmemme ịdị ọcha ahụ ga-anọ tupu e mechaa ya, nakwa mgbe ịchụ aja nʼihi ha nʼotu nʼotu ga-abụ.
ACT 21:27 Ma mgbe ọ fọdụrụ nwa oge nta ka ụbọchị asaa ahụ gwụchaa, ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ha tikuru igwe mmadụ ma kpaliekwa ha. Ha jidere ya,
ACT 21:28 na-eti mkpu, “Ndị ikom Izrel, nyerenụ anyị aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-ejegharị nʼebe niile na-ezi ozizi megidere ndị nke anyị, iwu anyị nakwa ebe a. Ma nke kachasị nke, ọ merụọkwala ụlọnsọ a site nʼịkpọbata ndị Griik nʼime ya.”
ACT 21:29 (Nʼihi na ha ebula ụzọ hụ ya na Trofimọs onye Efesọs nʼime obodo, ha chere na Pọl kpọbatara ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ.)
ACT 21:30 Ọgbaaghara jupụtara nʼobodo ahụ niile. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Nʼotu mgbe ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ niile.
ACT 21:31 Mgbe ha na-achọ igbu ya, ozi ruru ọchịagha ntị na Jerusalem niile nọ nʼọgbaaghara.
ACT 21:32 Otu mgbe ahụ o duuru ụfọdụ ndịisi agha ya na ndị agha ya mee ngwangwa bịaruo nʼebe ha nọ. Mgbe ha hụrụ ndị agha ka ha na-abịa, ha kwụsịrị iti Pọl ihe.
ACT 21:33 Ọchịagha ahụ bịara jide ya, nye iwu ka e were ụdọ igwe abụọ kee ya agbụ, ọ jụkwara onye ọ bụ na ihe o mere.
ACT 21:34 Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu na-ekwu otu ihe, ebe ụfọdụ na-eti na-ekwu ihe ọzọ. Mgbe ọ na-apụghị ịchọpụta ihe bụ isi mkpọtụ na ọgbaaghara ahụ, o nyere iwu ka e duru ya gaa nʼogige ndị agha.
ACT 21:35 Mgbe o rutere na mgbagolite ọnụ ụzọ ụlọ ahụ, ndị agha bulitere ya elu nʼihi ọgbaaghara igwe ndị mmadụ dị ukwuu.
ACT 21:36 Igwe mmadụ ahụ so ha nọ na-eti mkpu, “Wepụnụ ya! Wepụnụ ya!”
ACT 21:37 Mgbe ha chọrọ iduba Pọl nʼime ogige ahụ, ọ sịrị ọchịagha ahụ, “Ị ga-ekwe ka m gwa gị okwu?” Ọ sịrị, “I maara asụ asụsụ ndị Griik?
ACT 21:38 Ọ pụtara na ị bụghị onye Ijipt ahụ malitere ọgbaaghara ma duuru puku ndị ogbu mmadụ anọ gbalaa nʼọzara?”
ACT 21:39 Pọl sịrị, “Abụ m onye Juu si Tasọs, obodo dị na Silisia, nwa afọ oke obodo amara aha ya. Biko, kwee ka m gwa ndị mmadụ okwu.”
ACT 21:40 Mgbe o nyere ya ikike, Pọl guzooro nʼihe nrigo nke ọnụ ụzọ ahụ fee aka ya ime ka ha nọọ duu. Mgbe ha nọdụrụ nwayọọ, ọ gwara ha okwu nʼasụsụ Hibru sị,
ACT 22:1 “Ụmụnna m na ndị nna anyị, geenụ m ntị mgbe m na-agọrọ onwe m nʼihu unu.”
ACT 22:2 Mgbe ha nụrụ na ọ na-agwa ha okwu nʼasụsụ Hibru, ha deere duu karịa. Mgbe ọ sịrị,
ACT 22:3 “Abụ m onye Juu. Amụrụ m na Tasọs nʼime Silisia. Azụrụ m na obodo a nʼụkwụ Gamaliel onye nkuzi m. Anatara m ọzụzụ dị ike na ịsọpụrụ iwu nke nna nna anyị ha ejikwa m ịnụ ọkụ nʼobi na-efe Chineke dịka unu niile si eme taa.
ACT 22:4 Akpagburu m ndị niile na-eso ụzọ ọhụrụ a, na-etinye ha nʼaka ọnwụ. Ejidere m ndị ikom na ndị inyom ha tụbakwa ha nʼụlọ mkpọrọ.
ACT 22:5 Ma dịka onyeisi nchụaja na nzukọ ndị okenye niile pụrụ ịgbara m akaebe. Anatakwara m nʼaka ha akwụkwọ ozi e deere ụmụnna anyị nọ na Damaskọs. Agara m ebe ahụ ịkpụta ha nʼagbụ bịa Jerusalem maka ịta ha ahụhụ.
ACT 22:6 “Nʼetiti ehihie, mgbe m na-aga nʼụzọ, nʼebe dị Damaskọs nso, oke ìhè nke si nʼeluigwe, chara gburugburu m.
ACT 22:7 Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’
ACT 22:8 “ ‘Onye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ. “Ọ sịrị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-akpagbu.’
ACT 22:9 Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu.
ACT 22:10 “Asịrị m, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’ “Onyenwe anyị sịrị m, ‘Bilie banye Damaskọs; nʼebe ahụ a ga-agwa gị ihe niile a kwadobere na ị ga-eme.’
ACT 22:11 Nʼihi na-enweghị m ike ịhụ ụzọ nʼihi ebube ìhè ahụ chachiri m anya. Ya mere ndị mụ na ha so sekpụụrụ m nʼaka bata na Damaskọs.
ACT 22:12 “Nʼebe ahụ ka Ananayas bi, bụ onye anyị pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihi idebe iwu. O nwekwara ọgbụgba ama dị mma site nʼọnụ ndị Juu bi nʼebe ahụ.
ACT 22:13 Ọ bịakwutere m, guzoro nʼakụkụ m sị, ‘Nwanna anyị Sọl, ka emee ka ị hụ ụzọ!’ Otu mgbe ahụ, e nwetara m ike ịhụ ụzọ, m hụkwara ya.
ACT 22:14 “Mgbe ahụ, ọ sịrị, ‘Chineke nke nna nna anyị ha ahọpụtala gị ịmara uche ya na ịhụ Onye Ezi Omume ahụ na ịnụta okwu site nʼọnụ ya.
ACT 22:15 Ị ga-abụ onyeama ya nye ndị niile banyere ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ.
ACT 22:16 Ma ugbu a, gịnị ka ị na-eche? Bilie ọtọ, ka e mee gị baptizim, ka a sachakwa gị site na mmehie, na-akpọkukwa aha ya.’
ACT 22:17 “Mgbe m lọghachikwara na Jerusalem, nọrọ na-ekpe ekpere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ahụrụ m ọhụ,
ACT 22:18 ebe ọ na-agwa m, ‘Mee ngwa! Hapụ Jerusalem, nʼihi na ndị bi nʼala a agaghị anara ọgbụgba ama gị banyere m.’
ACT 22:19 “Ma asịrị m, ‘Onyenwe anyị, ndị a maara nke ọma na m na-aga nʼụlọ nzukọ nʼotu nʼotu, na-atụba ndị kwere na gị nʼụlọ mkpọrọ, na-etikwa ha ihe.
ACT 22:20 Nʼoge a na-awụfu ọbara onyeama gị bụ Stivin, eguzo m nso na-akwado nʼihe emere dị mma, ma na-elekọtakwa uwe ndị ahụ tụgburu ya anya.’
ACT 22:21 “Mgbe ahụ, ọ sịrị m, ‘Gawa; nʼihi na aga m ezipu gị ebe dị anya ijekwuru ndị mba ọzọ.’ ”
ACT 22:22 Ha ṅara ya ntị ruo ugbu a. Mgbe ahụ, ha niile tiri mkpu nʼotu olu sị, “Wepụnụ onye dị otu a nʼụwa! O kwesighị ka onye dị otu a dịrị ndụ!”
ACT 22:23 Ha tiri mkpu na-atụli uwe mgbokwasị ha elu, na-achilikwa aja nʼala na-efesasị ya ebe niile,
ACT 22:24 ọchịagha ahụ nyere iwu ka a kpụgaa ya nʼogige ndị agha, pịa ya ụtarị, ka eziokwu pụta ya nʼọnụ. Ọ chọrọ ịmata ihe mere ha ji eti mkpu otu a megide ya.
ACT 22:25 Ma mgbe ha chịịrị ụdọ akpụkpọ kechaa ya, Pọl sịrị onye agha guzo ya nso, “Ọ bụ ihe ziri ezi nʼiwu na unu ga-eti nwa afọ Rom ihe, onye na-enweghị ikpe a mara ya?”
ACT 22:26 Mgbe onye agha a nụrụ okwu a, o jekwuuru ọchịagha ahụ sị, “Gịnị ka ị na-aga ime? Nwoke a bụkwa onye Rom.”
ACT 22:27 Ọchịagha ahụ bịakwutere sị ya, “Gwa m, ị bụ onye Rom?” Ọ sịrị, “E.”
ACT 22:28 Ọchịagha ahụ zara, “ma o furu m ego dị ukwuu iji bụrụ onye Rom.” Ma Pọl sịrị, “Amụrụ m dịka nwa afọ ala a.”
ACT 22:29 Ndị ahụ chọrọ ịgba ya ajụjụ ọnụ mere ngwangwa wezuga onwe ha. Egwu tụkwara ọchịagha nʼonwe ya mgbe ọ matara na ọ bụ nwa afọ Rom, nʼihi na o keela ya rịị agbụ na mbụ.
ACT 22:30 Nʼechi ya, ebe ọ chọrọ ịmata ihe bụ isi okwu na ihe mere ndị Juu ji ebo ya ebubo, o nyere iwu ka ndịisi nchụaja na ndị ụlọ ikpe ha zukọọ. Mgbe ahụ, o dupụtara Pọl, mee ka o guzo nʼihu ha.
ACT 23:1 Mgbe Pọl legidere ndị nzukọ a anya, ọ sịrị, “Ụmụnna m, mụ onwe m ejirila ezi akọnuche bie ndụ m niile nʼihu Chineke ruokwa ụbọchị taa.”
ACT 23:2 Nke a mere, Ananayas onyeisi nchụaja nyere iwu ka ndị nọ ya nso tie ya aka nʼọnụ.
ACT 23:3 Ma Pọl, sịrị ya, “Otu a ka Chineke ga-esi tie gị, gị mgbidi e tere nzu. Ụdị onye ikpe dị aṅaa ka ị bụ i ji na-emebi iwu nʼonwe gị site nʼinye iwu ka e si otu a tie m ihe?”
ACT 23:4 Ndị guzo ya nso sịrị, “Ị na-ekwutọ onyeisi nchụaja Chineke?”
ACT 23:5 Ma Pọl sịrị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ekwula okwu ọjọọ ọbụla megide onye na-achị ndị nke gị.’”
ACT 23:6 Mgbe Pọl chọpụtara na otu ụzọ nʼime nzukọ ahụ bụ ndị otu Sadusii, ebe ndị ọzọ bụkwa ndị Farisii, o tiri mkpu nʼime nnọkọ ahụ sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii na nwa ndị Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nʼihi olileanya m nwere na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.”
ACT 23:7 Mgbe o kwusiri nke a esemokwu dapụtara nʼetiti ndị Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ kewara.
ACT 23:8 Nʼihi na ndị Sadusii na-asị na mbilite nʼọnwụ maọbụ mmụọ ozi maọbụ mmụọ ọbụla adịghị. Ma ndị Farisii kweere nʼihe ndị a niile.
ACT 23:9 Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nʼotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nʼoke olu sị, “Anyị ahụghị ihe ọjọọ nʼebe nwoke a nọ, ma gịnịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ, maọbụ mmụọ ozi gwara ya okwu?”
ACT 23:10 Esemokwu a bịara karịa, nke mere na onyeisi ọchịagha tụrụ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya ka ha banye were ike kpọpụta ya, ziga ya nʼogige ndị agha.
ACT 23:11 Nʼabalị ya, Onyenwe anyị bịakwutere ya sị, “Nwee obi ike, dịka i si gbaa ama banyere m na Jerusalem, ị ghaghị ịgbakwara m ama na Rom.”
ACT 23:12 Nʼụtụtụ echi ya ụfọdụ ndị Juu zukọtara gbaa izu, ṅụọkwa iyi na ha agaghị eri nri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu Pọl.
ACT 23:13 Ndị zukọtara gbaa izu ọjọọ a karịrị iri mmadụ anọ.
ACT 23:14 Ha jekwuuru ndịisi nchụaja ha na ndị okenye, sị ha, “Anyị kwekọtara ịhapụ iri maọbụ ịṅụ ihe ọbụla tutu ruo mgbe anyị gburu Pọl.
ACT 23:15 Ugbu a, unu na nzukọ zienụ onyeisi ọchịagha ka ọ kpọpụtara unu ya. Meenụ ka unu na-achọ ịjụpụtasị eziokwu nʼọnụ ya nakwa itule ikpe ya nke ọma. Anyị dị njikere igbu ya nʼụzọ tupu ọ bịaruo unu nso.”
ACT 23:16 Ma nwa nwanne nwanyị Pọl nụrụ maka izuzu ọjọọ a. Ọ banyere nʼogige ndị agha kọọrọ Pọl.
ACT 23:17 Pọl kpọrọ otu nʼime ndịisi agha ahụ gwa ya, “Biko kpọrọ nwokorobịa a gaa nʼebe ọchịagha nọ, o nwere okwu dị mkpa ọ chọrọ ịgwa ya.”
ACT 23:18 Ọ kpọọrọ ya jekwuru onyeisi agha, sị. “Pọl, onye mkpọrọ, kpọrọ m rịọ m ka m kpọtara gị nwokorobịa a nʼihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa gị.”
ACT 23:19 Onyeisi agha ahụ duuru ya nʼaka ya gaa nʼakụkụ ọzọ jụọ ya, “Gịnị bụ ihe ị chọrọ ịkọrọ m?”
ACT 23:20 Ọ sịrị, “Ndị Juu ụfọdụ ekwekọrịtala ịrịọ gị ka ị kpọpụta Pọl echi na nzukọ ụlọ ikpe. Ha ga-eme dịka ha nwere ihe dị mkpa ha chọrọ ịjụta ya.
ACT 23:21 Ma aṅala ha ntị. Nʼihi na ihe karịrị iri mmadụ anọ na-ezo onwe ha na-eche inwude ya. Ndị a gbara ndụ na ha agaghị eri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu ya. Ha adịla njikere, ihe a na-eche bụ mkpebi gị nye arịrịọ ha.”
ACT 23:22 Ọchịagha ahụ zilagara nwokorobịa ahụ site nʼinye ya iwu, “Emekwala ka onye ọbụla mata na ị bịara gwa m ihe dị otu a.”
ACT 23:23 Mgbe e mesịrị, ọ kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndịisi agha nye ha iwu sị, “Gaanụ jikere narị ndị agha abụọ, na iri mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya, tinyere narị ndị ikom abụọ ndị na-ama ùbe, ndị ga-aga Sizaria nʼelekere itoolu nke abalị a.
ACT 23:24 Nyekwa Pọl ịnyịnya nke ọ ga-agba, ka e nwee ike duru ya gakwuru Feliks bụ gọvanọ nʼudo.”
ACT 23:25 O dere akwụkwọ nʼolu dị otu a:
ACT 23:26 Klọdiọs Lisias, Na-edegara Feliks onye nsọpụrụ na-adịrị, onye na-achị akụkụ a. Ana m ekele gị.
ACT 23:27 Ndị Juu jidere nwoke a chọọ igbu ya, ma mgbe m nụrụ na ọ bụ onye Rom, mụ na ndị agha m bịara napụta ya nʼaka ha.
ACT 23:28 Achọrọ m ịmata ihe mere ha ji ebo ya ebubo, nʼihi ya eduuru m ya gaa nʼọgbakọ ndị okenye ha.
ACT 23:29 Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe banyere iwu ha. Nʼeziokwu, o nweghị ihe ọbụla kwesiri iji tụọ ya mkpọrọ maọbụ ọnwụ nʼime ebubo ahụ.
ACT 23:30 Mgbe a gwara m banyere izuzu a na-agba megide nwoke a, ezitere m gị ya nʼegbughị oge. Enyekwara m ndị niile na-ebo ya ebubo iwu, ka ha bịa nʼihu gị kpee ọnụ ha.
ACT 23:31 Ya mere, nʼabalị ahụ, ndị agha dubatara Pọl na Antipatris dịka e nyere ha nʼiwu.
ACT 23:32 Nʼechi ya, ha hapụrụ ya na ndị na-agba nʼelu ịnyịnya ka ha duru ya gawa, ebe ha laghachiri nʼogige ndị agha.
ACT 23:33 Mgbe ha bịarutere Sizaria, ha nyere onyeisi obodo ahụ akwụkwọ ozi, ma kpọnyekwa ya Pọl.
ACT 23:34 Gọvanọ ahụ gụrụ akwụkwọ ozi ahụ, jụọ ya akụkụ ala o si pụta. Mgbe ọ matara na ọ bụ onye Silisia,
ACT 23:35 ọ sịrị ya, “Aga m enye okwu gị ezigbo ohere mgbe ndị na-ebo gị ebubo bịara.” O nyekwara iwu ka e debe ya nʼobi Herọd nʼaka ndị nche.
ACT 24:1 Mgbe ụbọchị ise gasịrị, onyeisi nchụaja bụ Ananayas na ụfọdụ ndị okenye ndị Juu na lọya ha aha ya bụ Tatulọs bịara. Ha dum pụtara ịgbagide Pọl ama nʼihu onye na-achị obodo.
ACT 24:2 Mgbe a kpọbatara ya, Tatulọs pụtara guzo boo ya ebubo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka ị bụ. Nʼihi gị, mmadụ niile enwela udo ogologo mgbe. Ịdị nkọ nke uche gị emeela ka mgbanwe dị nʼobodo a.
ACT 24:3 Anyị ji ekele nke jupụtara nʼọṅụ na-anabata ihe ndị a nke ọma, nʼebe niile na nʼụzọ niile, gị Feliks, onye a na-asọpụrụ.
ACT 24:4 Achọghị m itufu oge gị. Ana m arịọ ka i were ndidi na obiọma nụrụ nkenke okwu anyị ji bịa.
ACT 24:5 “Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-akpalikarị ọgbaaghara, onye ọrụ ya bụ ịkwagide ndị Juu nọ nʼebe niile nʼụwa a ka ha nupu isi. Ọ bụkwa onyeisi nke ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu ndị Nazaret.
ACT 24:6 Ọ chọkwara imerụ ụlọnsọ anyị, ya mere anyị ji jide ya. Ma anyị chọrọ ikpe ya ikpe dịka omenaala anyị siri dị,
ACT 24:7 ọchịagha Lisias, bịara jiri ike napụ ya nʼaka anyị.
ACT 24:8 Ọ bụrụ na inyochaa ya, ị ga-enwe ike ịghọta ihe niile banyere ebubo anyị na-ebo ya.”
ACT 24:9 Ndị Juu kwadokwara okwu ya, na ihe niile e boro ya, bụ ihe mere eme.
ACT 24:10 Mgbe gọvanọ feere ya aka ka o kwuo okwu, Pọl zara, “amaara m na ị bụ onye ọkaikpe nke mba a ogologo mgbe. Nke a na-enye m obi ụtọ ịgọpụ onwe m nʼihu gị.
ACT 24:11 Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ kemgbe m rigooro nʼụlọnsọ ukwu na Jerusalem ife ofufe.
ACT 24:12 Ha ahụghị m ka mụ na onye ọbụla na-arụrịta ụka nʼụlọnsọ, maọbụ na o nwere ebe m kpatara ọgbaaghara nʼime ụlọ nzukọ, maọbụ ebe ọbụla nʼime obodo.
ACT 24:13 Ha enwekwaghị ihe ọbụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m.
ACT 24:14 Agaghị m agọ agọ nʼihu gị na m na-ekpere Chineke nke nna anyị ha, dịka onye na-eso Ụzọ ahụ ha na-akpọ otu. Ekwenyere m ihe niile dịka usoro nke iwu si dị, na nke e dere nʼakwụkwọ ndị amụma.
ACT 24:15 Ma enwere m olileanya nʼebe Chineke nọ dịka ha onwe ha nwekwara, na mbilite nʼọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị.
ACT 24:16 Nʼihi nke a, a na m agbalị inwe akọnuche dị ọcha nʼihu Chineke na nʼihu mmadụ niile.
ACT 24:17 “Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịara m Jerusalem iwetara ndị nke m onyinye, nakwa ịchụrụ Chineke aja.
ACT 24:18 Emezuola m omenaala ịdị ọcha mgbe ha hụrụ m nʼụlọnsọ ukwu ahụ mgbe m na-eme nke a. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m maọbụ na m sonyere ọgbaaghara ọbụla.
ACT 24:19 Ma enwere ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa, bụ ndị kwesiri ịnọ nʼebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọbụla megide m.
ACT 24:20 Maọbụ ndị nke nọ nʼebe a ugbu a, ka ha kwuo ajọ omume ọbụla ha hụrụ nʼime m mgbe m guzoro nʼihu ndị nzukọ ndị okenye.
ACT 24:21 Karịa na m kwuru naanị otu ihe mgbe m guzoro nʼihu ha tie mkpu, ‘A na-ekpe m ikpe taa nʼihi okwukwe m na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.’ ”
ACT 24:22 Mgbe ahụ, Feliks onye maara ihe banyere Ụzọ ahụ nke ọma yigharịrị ikpe a. Ọ gwara ha, “Aga m eleba anya nʼikpe gị a, mgbe Lisias onyeisi agha bịara.”
ACT 24:23 O nyere ọchịagha ahụ iwu ka e debe ya nʼokpuru nlekọta ha. Ma ka ha nye ya ohere inwere onwe ya ime ụfọdụ ihe, ka ha kwekwa ka ndị enyi ya bịa nyere ya aka gboo mkpa ya.
ACT 24:24 Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Feliks na nwunye ya Drusila, bụ onye Juu bịara, ọ kpọrọ Pọl ka ọ gwa ha okwu banyere inwe okwukwe nʼime Jisọs Kraịst.
ACT 24:25 Ma mgbe ọ gara nʼihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dị mmadụ ijide onwe ya aka, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nʼoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ sịrị, “I nwere ike ịpụ ugbu a. Aga m akpọkwa gị nʼoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.”
ACT 24:26 Ọ na-atụkwa anya na Pọl ga-enye ya ego. Ya mere o jiri na-eziga ka a na-akpọ ya site nʼoge ruo nʼoge ka ya na ya na-akparịta ụka.
ACT 24:27 Mgbe afọ abụọ gasịrị, onye a na-akpọ Pọshiọs Festọs nọchiri anya Feliks. Ma ebe ọ chọrọ inweta ihuọma nʼaka ndị Juu, Feliks hapụrụ Pọl nʼụlọ mkpọrọ.
ACT 25:1 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site nʼoge Festọs bịara na mpaghara ọchịchị ya, o sitere Sizaria garuo Jerusalem.
ACT 25:2 Nʼebe ahụ ka ndịisi nchụaja na ndịisi ndị Juu kọwara ya ihe banyere Pọl.
ACT 25:3 Ha rịọkwara ya nʼamara ọ ga-emere ha bụ ime ka Pọl bịa na Jerusalem. Nʼihi na ha agbaala izu igbu ya nʼụzọ.
ACT 25:4 Ma Festọs zara, “Pọl nọ dịka onye mkpọrọ na Sizaria. Ebe ahụ ka mụ onwe m ga-alaghachi na mgbe na-adịghị anya.
ACT 25:5 Ya mere, ka ndịisi unu ji ikike soro m gaa, boo nwoke ahụ ebubo ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọjọọ o mere.”
ACT 25:6 Ọ nọnyeere ha ihe dịka ụbọchị asatọ maọbụ ụbọchị iri, tupu ọ laghachi na Sizaria. Nʼụbọchị so ya, ọ nọdụrụ nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọpụta Pọl.
ACT 25:7 Mgbe ọ bịaruru, ndị Juu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu na-ekwu ọtụtụ ihe megide ya nke ha na-enweghị ike ịkọwa.
ACT 25:8 Ma Pọl gọọrọ onwe ya, na-asị, “Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide iwu ndị Juu maọbụ ụlọnsọ, maọbụ Siza.”
ACT 25:9 Ma ebe Festọs na-achọ inwe ihuọma nʼebe ndị Juu nọ, ọ sịrị Pọl, “Ị chọrọ ịga Jerusalem ka m kpee gị ikpe nʼebe ahụ?”
ACT 25:10 Ma Pọl sịrị, “Eguzo m nʼụlọikpe Siza nʼonwe ya, ebe e kwesiri ka a nọdụ kpee m ikpe. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ndị Juu, dịka ị maara nke ọma.
ACT 25:11 Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesiri ọnwụ, anaghị m arịọ ka m gbanarị ọnwụ. Ma ọ bụrụ na ọ dịghị eziokwu dị nʼebubo ndị Juu a na-ebo m, mmadụ ọbụla agaghị e were m nyefee nʼaka ha. Ya mere, ọ bụ Siza ka m na-akpọku.”
ACT 25:12 Ya mere, mgbe Festọs na ndị na-adụ ya ọdụ gbara izu, ọ zara, “Ị kpọkuola Siza, ọ bụkwa Siza ka ị ga-agakwuru.”
ACT 25:13 Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, eze Agripa na Benaisi bịara Sizaria ịnabata Festọs.
ACT 25:14 Mgbe ha nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, Festọs kọwara eze a ọnọdụ Pọl sị, “Ọ dị nwoke Feliks hapụrụ nʼụlọ mkpọrọ nʼebe a.
ACT 25:15 Mgbe m gara Jerusalem, ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu gwara m banyere ya. Ha rịọkwara ka m maa ya ikpe.
ACT 25:16 “Ma emere m ka ha ghọta na o megidere iwu ndị Rom ịrara mmadụ ọbụla nye tupu ekpee ya ikpe nyekwa ya ohere ịgọrọ onwe ya nʼihu ndị na-ebo ya ebubo.
ACT 25:17 Nʼihi nke a, mgbe ha bịara nʼebe a, atụfughị m oge ọbụla, kama nʼụbọchị nke ọzọ ya, anọdụrụ m nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọbata nwoke ahụ.
ACT 25:18 Mgbe ndị na-ebo ya ebubo biliri, ọ dịghị otu nʼime ụrụ ala ndị m chere ha ga-akpọ aha nke ha gụpụtara na o mere.
ACT 25:19 Okwu ha niile bụ ịrụ ụka banyere okpukpe ha, na banyere otu onye ọzọ a na-akpọ Jisọs onye nwụrụ, onye Pọl na-ekwusịkwa ike na ọ dị ndụ.
ACT 25:20 Ọ rara m ahụ imedo okwu dị otu a. Nʼihi ya, a jụrụ m ya ma ọ ga-amasị ya ị ga nʼụlọikpe dị na Jerusalem ka ọ nọrọ nʼebe ahụ gọrọ onwe ya.
ACT 25:21 Ma Pọl rịọrọ ka e debe ya nʼụlọ mkpọrọ ruo mgbe Siza nʼonwe ya ga-ekpebi ikpe ya. Ya mere, ezighachiri m ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo mgbe m jikeere izigara ya Siza.”
ACT 25:22 Agripa gwara Festọs, “Achọrọ m ịnụ okwu site nʼọnụ nwoke a nʼonwe ya.” Ọ sịrị, “Ị ga-anụ ya echi.”
ACT 25:23 Ya mere, nʼechi ya, Agripa na Benaisi rutere nʼụlọ ọha na-anọ anụ ikpe nʼoke nganga. Ọtụtụ ndịisi agha na ndị a maara aha ha nʼobodo a sooro ha. Festọs nyere iwu ka a kpọbata Pọl.
ACT 25:24 Festọs sịrị, “Eze Agripa na ndị niile soro anyị nọrọ nʼebe a, unu ahụla nwoke a onye ọha ndị Juu niile, ma ndị nọ nʼebe a ma ndị nọ na Jerusalem, wetara ikpe ya nʼaka m na-eti mkpu na o kwesighị ịdị ndụ ọzọ.
ACT 25:25 Ma achọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke kwesiri ka ọ nwụọ. Ma ebe ọ rịọrọ ka Siza lenye ikpe ya anya, ekpebiri m iziga ya.
ACT 25:26 Ma enweghị m ihe ọbụla doro anya m ga-edegara Siza banyere ya. Ya mere m jiri kpọpụta ya nʼihu unu niile, ma karịsịa nʼihu gị onwe gị eze Agripa, ka ọ ga-abụ anyị tulesịa ihe banyere ya, ka m nwee ihe m ga-ede.
ACT 25:27 Nʼihi na ọ bụ ihe na-ezighị ezi na m ga-ezipụ onye mkpọrọ na-egosighị nʼebubo e boro ya.”
ACT 26:1 Agripa gwara Pọl, “Ị nwere ike i kwuru ọnụ gị.” Mgbe ahụ, Pọl gbasara aka ya abụọ bido ikwu okwu ịgọrọ onwe ya,
ACT 26:2 “Ana m agụ onwe m dịka onye nwere ihuọma, eze Agripa, inwe ohere ọma dị otu a, ịzara ọnụ m nʼihu gị nʼihe niile metụtara ebubo ndị Juu na-ebo m.
ACT 26:3 Nke ka nke, amatara m na omenaala ndị Juu na ịrụ ụka metụtara iwu ha doro gị anya. Biko ana m arịọ gị ka i jiri ndidi gee m ntị.
ACT 26:4 “Ndị Juu niile maara ibi ndụ m site na nwata m. Ha makwa site na mbụ, otu m si bie ndụ m niile nʼobodo nke m, nakwa nʼime Jerusalem.
ACT 26:5 Ha matara kemgbe ogologo oge, ha ga-agbakwa ama, ma ọ bụrụ na ha chọrọ ikwu eziokwu, na site na mbụ e biri m ndụ dịka otu onye so nʼime otu ahụ nke iwu ya dị ike karịchasịa nʼime okpukpe ndị Juu, nke bụ otu ndị Farisii.
ACT 26:6 Ma ugbu a, a na-ekpe m ikpe nʼihi na enwere m olileanya na nkwa ahụ Chineke kwere nna nna anyị ochie ha.
ACT 26:7 Nkwa nke ebo iri na abụọ niile na-ele anya ịnata mgbe ha na-efe ofufe ehihie na abalị. Eze Agripa, ọ bụ nʼihi olileanya a, gị onye a na-asọpụrụ, ka ndị Juu ji na-ebo m ebubo.
ACT 26:8 Gịnị mere unu jiri na-eche na ọ rara Chineke ahụ ime ka ndị nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie?
ACT 26:9 “Na mbụ, anara m eche na apụrụ m imeso aha Jisọs onye Nazaret mmeso ọjọọ niile.
ACT 26:10 Otu a ka m mere na Jerusalem. Ọ bụghị naanị na m natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja jiri ya kpọchie ọtụtụ ndị nsọ nʼụlọ mkpọrọ, ewelikwara m aka elu nʼoge a na-ama ha ikpe ọnwụ.
ACT 26:11 Ọtụtụ mgbe ka m hụrụ na a tara ha ahụhụ nʼụlọ nzukọ niile. Agbalịrị m ịkwagide ha ka ha kwuo arụ ma kwutọkwa okwukwe ha. Nʼihi na iwe m dị ọkụ megide ha, esogburu m ha nʼobodo dị iche iche nke na-abụghị obodo ndị Juu.
ACT 26:12 “Nʼihi nke a, a gara m Damaskọs site nʼikike na nkwenye nke ndịisi nchụaja. Anatakwara m ike nʼaka ndịisi nchụaja.
ACT 26:13 Nʼoge ehihie, eze Agripa, mgbe mụ na ndị otu m na-aga nʼụzọ, gị onye a na-asọpụrụ, ka m hụrụ ìhè nke na-acha karịa anyanwụ ka o si nʼeluigwe chaa m na ndị mụ na ha so gburugburu.
ACT 26:14 Anyị niile dara nʼala. Ma anụrụ m olu gwara m okwu nʼasụsụ Hibru, ‘Sọl! Sọl! Gịnị mere i ji na-akpagbu m? Ị na-emerụ onwe gị ahụ site nʼịkpọ ụkwụ na ndụdụ e ji achị ehi.’
ACT 26:15 “Asịrị m, ‘Ị bụ onye, Onyenwe anyị?’ “Onyenwe anyị kwuru, ‘Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu.
ACT 26:16 Ugbu a, bilie, kwụrụ ọtọ! Nʼihi na-emere m ka ị hụ m anya, ka m họpụta gị ka ị bụrụ onyeozi m na onye akaebe m. Ị ga-emekwa ka ụwa niile mara ihe banyere nzute a i zutere m taa, na ọtụtụ mgbe ọzọ m ga-ezute gị.
ACT 26:17 Aga m azọpụta gị site nʼaka ndị nke gị na sitekwa nʼaka ndị mba ọzọ, ndị m na-eziga gị ka i jekwuru.
ACT 26:18 Imeghe anya ha mee ka ha si nʼọchịchịrị lọghachi banye nʼìhè, sikwa nʼike nke ekwensu lọghachikwute Chineke. Ka ha site nʼokwukwe ha nwere nʼebe m nọ nata mgbaghara mmehie ha, ketakwa oke ahụ dị ngọzị nʼetiti ndị e doro nsọ.’
ACT 26:19 “Ya mere, eze Agripa, enupughị m isi nʼọhụ nke eluigwe ahụ.
ACT 26:20 Ebidoro m izisa oziọma a na Damaskọs. Emekwara m otu a na Jerusalem na nʼime Judịa niile na nʼetiti ndị mba ọzọ. Ana m ekwusa mkpa ọ dị ka mmadụ niile nwee nchegharị lọghachikwute Chineke. Ka ha gosikwa nchegharị ha site nʼezi ọrụ nke ha na-arụ.
ACT 26:21 Ọ bụ nʼihi nke a ka ndị Juu jiri nwụchie m nʼụlọnsọ ukwu ahụ ma chọsiekwa ụzọ ike ịnapụ m ndụ m.
ACT 26:22 Ma Chineke chebere m mee ka m bụrụ onye dị ndụ taa, ịkọrọ mmadụ niile akụkọ a, ndị ukwu na ndị nta. Ihe m na-ekwu bụkwa ihe ndị amụma na Mosis kwuru na ọ ga-emezu,
ACT 26:23 na Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ, bụrụkwa onye mbụ ga-esi nʼọnwụ bilie, iwetara ndị Juu na ndị mba ọzọ ìhè.”
ACT 26:24 Mgbe ọ na-agọpụ onwe ya, Festọs tiri mkpu, “Pọl, ị bụ onye isi mebiri! Oke mmụta gị emebiela gị isi.”
ACT 26:25 Ma Pọl sịrị, “Isi emebighị m, ezigbo nna anyị Festọs. Ihe m na-ekwu nʼanya udo bụ naanị eziokwu.
ACT 26:26 Eze nʼonwe ya makwaara ihe ndị a niile, nʼihi ya ejighị m egwu ọbụla agwa ya okwu a. Ekwenyere m na ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe ndị a merenụ nke ezonarịrị ya, nʼihi na o nweghị nke mere na nzuzo.
ACT 26:27 Gị eze Agripa, i kwenyeghị na ndị amụma? Amaara m na i kweere.”
ACT 26:28 Mgbe ahụ Agripa sịrị, “Pọl, ị na-achọ nʼime ntakịrị oge a ịkwagide m ka m bụrụ onye kwere na Kraịst?”
ACT 26:29 Ma Pọl sịrị, “Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na Chineke ga-ekwe, mee ka gị na ndị niile nọ nʼebe a bụrụ ihe mụ onwe m bụ nʼime Kraịst ma ewezuga agbụ ndị a.”
ACT 26:30 Mgbe ahụ eze biliri ọtọ, ya na Festọs na Benaisi nwunye ya na ndị ọzọ niile ya na ha nọ nʼoche.
ACT 26:31 Mgbe ha na-apụ, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Nwoke a emeghị ihe ọbụla kwesiri ọnwụ maọbụ ịga mkpọrọ.”
ACT 26:32 Agripa gwara Festọs, “A gaara a hapụ nwoke a ma ọ bụrụ na o nyefeghị Siza ikpe ya.”
ACT 27:1 Mgbe e kpebiri na anyị ga-eso ụgbọ mmiri gaa Itali, e nyefere Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nʼaka onyeisi na-elekọta ndị mkpọrọ aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha nke igwe ndị agha Ọgọstọs.
ACT 27:2 Anyị banyere nʼụgbọ sitere Adramitiọm nke na-ejikere ịga nʼọnụ mmiri nke dị nʼakụkụ obodo Eshịa. Anyị nupuru nʼoke osimiri, Arịstakọs, onye Masidonia sitere na Tesalonaịka sokwa anyị nʼije a.
ACT 27:3 Nʼechi ya, anyị rutere Saịdọn. Juliọs nwere obiọma nʼebe Pọl nọ. Ọ hapụkwara ya ka o jegharịara onwe ya izute ndị enyi ya. Ndị a lekwara anyị ọbịa nke ọma.
ACT 27:4 Nʼịgakwa nʼihu na mmiri ahụ, anyị zutere ifufe mmiri nke mere na anyị gara nʼazụ ala Saiprọs.
ACT 27:5 Anyị gafere ọnụ mmiri obodo Silisia na Pamfilia. Anyị bịaruru Mira nʼime obodo Lisia.
ACT 27:6 Nʼebe ahụ ka onye ọchịagha hụrụ ụgbọ onye Alegzandria nke na-aga Itali. O mere ka anyị banye nʼime ya.
ACT 27:7 Ụgbọ anyị ji, gara nwayọọ ọtụtụ ụbọchị na o siiri anyị ike irute Snidos. Ebe ọ bụ nʼoke ifufe ekweghị ka anyị gaa nʼihu, anyị enwekwaghị ike ịga nʼụzọ anyị, kama anyị si nʼazụ Kriit na ncherita ihu Salmone gafee.
ACT 27:8 Anyị jikwa nwayọọ na-agba nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ tutu ruo mgbe anyị sitere nʼoke nsogbu rute ebe a na-akpọ ọnụ mmiri ọma, nke dị nso nʼobodo Lasia.
ACT 27:9 Anyị tufuru oge nʼebe ahụ. Ije ụgbọ mmiri abụrụkwala nke jupụtakwara nʼihe ize ndụ ugbu a, nʼihi na mmemme Obubu ọnụ nke ndị Juu agafeela. Nʼihi nke a, Pọl dụrụ mmadụ niile ọdụ,
ACT 27:10 na-asị, “Ndị nwe m, a na m ahụta na njem a ga-abụ nke ihe egwu nke ga-eweta oke ịla nʼiyi. Ọ bụghị naanị nke ụgbọ mmiri na ibu o bu, ma metụtakwa ndụ anyị.”
ACT 27:11 Ma ọchịagha ahụ kwenyere nʼihe onyeisi ụgbọ na onye nwe ụgbọ kwuru karịa nke Pọl kwuru.
ACT 27:12 Ma ebe ọnụ mmiri a abụghị ebe dị mma ịnọ nʼoge oyi, ndị ka nʼọnụọgụgụ họọrọ ka ụgbọ ahụ gaa nʼihu, nʼolileanya na a ga-eru Fonikisi ebe ha ga-anọdụ nʼoge oyi. Nke a bụ ọnụ mmiri dị na Kriit, nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ nʼakụkụ ugwu na akụkụ ndịda.
ACT 27:13 Mgbe ikuku dị nwayọọ bidoro ifegharị site na ndịda, ha chere na nke a bụ ohere dịrị ha. Nʼihi ya, ha kwọpụrụ ụgbọ nyara ya na-aga nso nso ọnụ mmiri Kriit.
ACT 27:14 Ma mgbe na-adịghị anya, oke ifufe dị egwu nke si nʼagbata ugwu na ọwụwa anyanwụ kuru site nʼagwa etiti ahụ rịdata.
ACT 27:15 Ndị na-anya ụgbọ ahụ gbalịsịrị ike na mbụ ichigharị ihu ụgbọ ahụ ka ọ gaa nʼọnụ mmiri, ma ọ pụghị ime. Anyị hapụrụ ya ka o soro ikuku.
ACT 27:16 Nʼikpeazụ, anyị kwọọrọ ụgbọ anyị gaa nʼazụ agwa etiti nta a na-akpọ Klọda. Nʼebe ahụ anyị jisiri ike kekwasị ụgbọ nta nke ụgbọ mmiri anyị na-adọkpụ nʼazụ nʼelu ụgbọ mmiri ahụ.
ACT 27:17 Emesịa, anyị jiri ụdọ kee ụgbọ mmiri ahụ ime ka o sie ike karịa. Ndị na-anya ụgbọ ahụ tụrụ egwu na ikuku ga-eburu ụgbọ anyị gaa nʼọnụ mmiri na-achị ọkụ nke dị na Satis. Ha wedatara akwa e kobere nʼelu, nke na-enyere ikuku aka ibu ụgbọ mmiri. Emesịa, ha sooro ikuku mmiri ahụ na-aga.
ACT 27:18 Mgbe chi bọrọ, dịka osimiri ahụ na-etonye etonye, ndị na-eso ụgbọ bidoro ịtụbasị ngwongwo ndị dị nʼụgbọ ahụ nʼime osimiri.
ACT 27:19 Nʼụbọchị nke atọ ha tụbakwara ngwongwo e ji edozi ụgbọ mmiri na ọtụtụ ihe ọbụla nke aka ha ghọtara nʼime osimiri.
ACT 27:20 Mgbe ọtụtụ ụbọchị gara ma ọ dịghị anyanwụ maọbụ kpakpando wapụtaranụ, ma oke ifufe ọjọọ ahụ gara nʼihu na-amagharị, nʼikpeazụ olileanya anyị na a ga-azọpụta anyị gwụsịrị.
ACT 27:21 Nʼoge a niile, o nweghị onye ọbụla nri ọbụla bara ọnụ. Ma nʼikpeazụ. Pọl kwụụrụ ọtọ nʼetiti ha sị, “Ndị ikom ibe m, ọ bụrụ na unu gere ntị nʼokwu m na mbụ, anyị agaraghị ahapụ Kriit. Anyị gara agbanarị mbibi na ịla nʼiyi nke a.
ACT 27:22 Ma otu ọ dị, ana m arịọ unu, nweenụ obi ike! Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu a ga-atụfu ndụ ya. Ọ bụ ezie na ụgbọ a ga-emikpu.
ACT 27:23 Nʼihi na nʼabalị gara aga, mmụọ ozi Chineke Onyenwe m, na onye m na-efekwa bịakwutere m,
ACT 27:24 ọ sịrị, ‘Atụla egwu Pọl, nʼihi na ị ghaghị iguzo nʼihu Siza. Nke ọzọkwa, Chineke emeela amara nye gị ndụ ndị a niile gị na ha so nʼụgbọ eme njem.’
ACT 27:25 Ya mere, ndị ikom nweenụ obi ike! Nʼihi na enwere m ntụkwasị obi na Chineke ga-eme dị ka o siri gwa m.
ACT 27:26 Ma otu ọ dị, a ga-eburu ụgbọ mmiri anyị buba ya nʼotu agwa etiti.”
ACT 27:27 Ihe dịka nʼetiti abalị nʼụbọchị nke iri na anọ ebili mmiri a, mgbe anyị na-erugharị nʼosimiri a na-akpọ Adratik, ndị na-anya ụgbọ chere na ala dị nso.
ACT 27:28 Ha tụnyere ụdọ e kenyere igwe nʼọnụ ya nʼime osimiri chọpụta na omimi osimiri ahụ dị narị nzọ ụkwụ na iri abụọ nʼebe ahụ ha nọ. Ha gakwara nʼihu tụọkwa ụdọ ahụ ọzọ chọpụta na omimi osimiri ahụ dị iri nzọ ụkwụ itoolu.
ACT 27:29 Ma egwu juru ha obi nʼihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara arịlịka anọ e ji ejide ụgbọ site nʼazụ ụgbọ ahụ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ.
ACT 27:30 Mgbe ndị na-eso ụgbọ ahụ kpebiri ịhapụ ya. Ha wedatara ụgbọ epeepe e dobere maka ihe mberede, mee dịka ha na-aga itinye arịlịka nʼọnụ ụgbọ mmiri ahụ.
ACT 27:31 Ma Pọl gwara ndị agha na ọchịagha ha okwu, “Ọ bụrụ na ndị a anọgideghị nʼime ụgbọ a, agaghị azọpụta unu.”
ACT 27:32 Nʼihi nke a, ndị agha ahụ gbubiri ụdọ e jiri kee ụgbọ epeepe ahụ hapụ ụgbọ epeepe ahụ ka ọ daba nʼime osimiri.
ACT 27:33 Mgbe chi bidoro ịbọ, Pọl rịọrọ mmadụ niile ka ha rie nri, na-asị, “Taa mere ya ụbọchị iri na anọ unu nọ na nche, nọgidekwa nʼibu ọnụ, nʼerighị ihe ọbụla.
ACT 27:34 Nʼihi ọdịmma nke ndụ unu, ana m arịọ unu ka unu rie ihe. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu otu agịrị isi ya ga-ala nʼiyi.”
ACT 27:35 Mgbe o kwuchara nke a, o weere achịcha nye Chineke ekele nʼihu ha niile, nyawaa ya, malitekwa iri ya.
ACT 27:36 Otu mgbe ahụ, obi ụtọ batara mmadụ niile nʼobi, ha bidokwara iri nri.
ACT 27:37 Anyị niile nọ nʼụgbọ ahụ dị narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii.
ACT 27:38 Mgbe anyị richara nri, ha buuru akpa ọka niile dị nʼụgbọ ahụ tụba ha nʼime osimiri ime ka ụgbọ ahụ gbaa mfe.
ACT 27:39 Mgbe chi bọrọ, ha enwekwaghị ike ịghọta akụkụ mmiri nke ha nọ nʼime ya. Ma ha hụrụ obosara ala nta nke nwere ọnụ mmiri. Ha gbara izu ịchọpụta ma ọ ga-ekwe mee ka ụgbọ mmiri ahụ site nʼebe ahụ gafee.
ACT 27:40 Ha chabisiri arịlịka niile ji ụgbọ ahụ, hapụ ha nʼime osimiri. Otu aka ahụkwa, ha tọpụrụ ụdọ ji ụmara e ji anyagharị ụgbọ. Mgbe ahụ, ha weliri akwa ifufe nke ọnụ ụgbọ nye ifufe, mekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nʼelu ala.
ACT 27:41 Ma ụgbọ mmiri ahụ gara maa isi na mkpumkpu aja mmiri, mikpuo nʼaja. Ọnụ ụgbọ ahụ mikpuru nke ukwuu mee ka isi ụgbọ ahụ laa elu, nke a nyere ebili mmiri a ohere iji ike tiwasịa azụ ụgbọ ahụ.
ACT 27:42 Ndị agha zubere igbu ndị mkpọrọ niile, ka onye ọbụla ghara igwuru mmiri site ya gbafuo.
ACT 27:43 Ma onye ọchịagha ahụ na-ezube ịzọpụta ndụ Pọl, nʼihi ya, o gbochiri ha nʼizuzu ha. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị niile maara igwu mmiri buru ụzọ si nʼụgbọ ahụ wụba nʼime mmiri, gwuru mmiri gaa nʼelu ala.
ACT 27:44 Ma ndị fọdụrụ ga-eru nʼelu ala site nʼịghọnye aka na obodobo osisi maọbụ nʼihe ndị ọzọ dị iche iche si nʼahụ ụgbọ ahụ dapụta. Nʼụzọ dị otu ka mmadụ niile ji bụrụ ndị rutere nʼelu ala nʼudo.
ACT 28:1 Mgbe a pụtara nʼọnụ mmiri ahụ nʼudo, anyị chọpụtara na aha agwa etiti ahụ bụ Malta.
ACT 28:2 Ndị obodo ahụ gosiri anyị obiọma nʼụzọ pụrụ iche. Ha kwanyere anyị ọkụ ma nabatakwa anyị nʼihi na mmiri nọ na-ezo, oyi na-atụkwa.
ACT 28:3 Nʼoge Pọl na-achịkọta nkụ itinye nʼọkụ a, otu agwọ ajụala sitere nʼime nkụ na-enwu ọkụ mapụta nʼihi okpomọkụ tụhịkọ onwe ya nʼaka ya.
ACT 28:4 Mgbe ndị obodo ahụ hụrụ agwọ ahụ ka ọ tụhịkọtara onwe ya nʼaka ya, ha gwarịtara onwe ha, “nʼezie a, nwoke a bụ ogbu mmadụ, a naghị eji ọkụ enyo ya. Ọ bụ ezie na azọpụtara ya site oke mmiri, ma ikpe ziri ezi ekweghị ka ọ dị ndụ.”
ACT 28:5 Ma Pọl fepụrụ agwọ ahụ nʼaka ya, mee ka ọ daba nʼọkụ, ọ dịghịkwa ihe mere ya.
ACT 28:6 Ha na-ele anya ma aka ya ọ ga-aza, maọbụ na ọ ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na o nweghị ihe mere ya, ha gbanwere obi ha bido na-ekwu, na ọ bụ chi.
ACT 28:7 Na nso ọnụ mmiri a ebe anyị kwụsịrị, otu ubi dị ya. Ọ bụ ubi Pobilios otu nwoke onyeisi na-achị agwa etiti ahụ. Ọ nabatara anyị nke ọma, lee anyị ọbịa ụbọchị atọ.
ACT 28:8 Nʼoge ahụ, nna Pobilios nwere ahụ ọkụ na afọ ọsịsa, Pọl banyere nʼime obodo gaa leta ya, kpeere ya ekpere, bikwasịkwa ya aka. Ahụ dịkwara ya mma.
ACT 28:9 Mgbe nke a mechara, ndị niile nwere nrịa nrịa nʼagwa etiti ahụ bịakwara, a gwọkwara ha.
ACT 28:10 Ha wetaara anyị ọtụtụ ihe onyinye. Mgbe oge ịnyapụ ụgbọ anyị ruru, ha nyere anyị ọtụtụ ihe dị anyị mkpa nke pụrụ idu anyị nʼije ahụ.
ACT 28:11 Anyị nọrọ ihe dịka ọnwa atọ nʼoge oyi, nʼagwa etiti ahụ tutu anyị anyalie ụgbọ. Ọ bụ ụgbọ ndị Alegzandria nke bu ihe a tụrụ atụ a na-akpọ ejima, bụ chi Kastọ na Polụkus.
ACT 28:12 Anyị bịaruru obodo Sirakọs ebe anyị nọrọ ụbọchị atọ.
ACT 28:13 Site nʼebe ahụ, anyị gara gburugburu tutu rute Rejiọm. Mgbe otu ụbọchị gafere, ikuku bidoro ife site na ndịda. Nʼụbọchị nke abụọ ya, anyị rutere Pọteọlị.
ACT 28:14 Nʼebe a anyị chọpụtara ndị kwere ekwe ndị rịọrọ ka anyị nọnyere ha ụbọchị asaa. Site nʼebe a, anyị rutere Rom.
ACT 28:15 Mgbe ụmụnna anyị nọ nʼebe ahụ nụrụ na anyị na-abịa. Ha pụtara zute anyị nʼụzọ Apiọs na nʼụlọ ndị Ije atọ. Mgbe Pọl hụrụ ha, o kelere Chineke ma bụrụ onye a gbara ume.
ACT 28:16 Mgbe anyị bịaruru Rom, e nyere Pọl ohere ibiri onwe ya dịka o si chọọ nʼebe masịrị ya. Ma otu onye agha na-eche ya nche.
ACT 28:17 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ kpọrọ ndịisi ndị Juu. Mgbe ha zukọrọ, ọ gwara ha, “Ụmụnna m, ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide ndị nke anyị, maọbụ megide omenaala nna nna anyị ha, ha jidere m na Jerusalem were m nyefee m nʼaka ndị Rom.
ACT 28:18 Ndị ọchịchị Rom lenyere anya nʼikpe m chọọ ịhapụ m ka m laa nʼihi na ha achọtaghị ihe kwesiri ịma m ikpe ọnwụ dịka ndị anyị chọrọ.
ACT 28:19 Ma mgbe ndị Juu jụrụ, ahụrụ m na ọ dị mkpa ibutere Siza ikpe m. Ma o nweghị ihe ọjọọ m bu nʼuche megide ndị obodo m.
ACT 28:20 Nʼihi nke a, ka m jiri rịọọ ka mụ na unu hụ ma kwurịtakwa okwu. Ọ bụ nʼihi olileanya nke Izrel ka e ji kee m nʼagbụ igwe a.”
ACT 28:21 Ha sịrị, “Anyị anataghị akwụkwọ ozi ọbụla site na Judịa banyere gị. Ọ dịghịkwa ụmụnna anyị ọbụla nke si ebe ahụ bịa nke kọrọ maọbụ kwuo okwu ọjọọ ọbụla banyere gị.
ACT 28:22 Otu ọ dị, anyị ga-achọ ịnụta ihe i chere, nʼihi na anyị maara na a na-ekwujọ otu a nʼebe niile.”
ACT 28:23 Ha yiri agba mgbe ha na ya ga-ezukọta nʼụbọchị ọzọ. Ọtụtụ mmadụ karịrị bịara nʼụlọ ebe ọ na-anọ. Ọ gbara ama banyere alaeze Chineke site nʼakwụkwọ iwu Mosis na nke ndị amụma, ọ gbalịrị ime ka ha kwenye nʼihe banyere Jisọs. O bidoro izi ha ihe site nʼụtụtụ ruo anyasị.
ACT 28:24 Ụfọdụ ka e mere ka ha kweere, ma ụfọdụ mechiri ntị ha na obi ha.
ACT 28:25 Ha nwe nghọtahie nʼetiti onwe ha ma malite ịla mgbe Pọl kwusiri okwu nke ikpeazụ a, “Mmụọ Nsọ Chineke kwuru eziokwu mgbe o sitere nʼọnụ Aịzaya onye amụma kwuo okwu nye nna nna anyị ha,
ACT 28:26 “ ‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu, “Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla, unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.”
ACT 28:27 Nʼihi na obi ndị a amaala abụba, dịkwa arọ; ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’
ACT 28:28 “Ya mere, a chọrọ m ka unu ghọta na nzọpụta a nke si nʼaka Chineke bịa, dịkwa nye ndị mba ọzọ, ha ga-egekwa ntị.”
ACT 28:29 Mgbe o kwusiri nke a, ndị Juu ahụ lara na-arụrịta ụka nke ukwu nʼetiti onwe ha.
ACT 28:30 O biri obi nke onwe ya afọ abụọ nʼụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya. Ọ na-anabatakwa ndị niile bịara ileta ya,
ACT 28:31 o ji mkwuwa okwu na-ekwusa ihe banyere alaeze Chineke na-akụzikwa ihe banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ dịkwaghị onye ọbụla gbalịrị igbochi ya.
ROM 1:1 Pọl, odibo Kraịst Jisọs, onye Chineke kpọrọ ka ọ bụrụ onyeozi ya na onye o kewapụtara ka o zisaa oziọma ya.
ROM 1:2 Oziọma a bụ nke ahụ Chineke kwere na nkwa nʼoge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya nke e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ.
ROM 1:3 Oziọma a metụtara Ọkpara ya, onye bụ nwa Devid site nʼọmụmụ nke anụ ahụ.
ROM 1:4 Onye esitere na Mmụọ nke ịdị nsọ họpụta ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼike nke mbilite nʼọnwụ, bụ Kraịst Jisọs, Onyenwe anyị.
ROM 1:5 Onye anyị sitere nʼaka ya nata amara na ọrụ ị bụ onyeozi, ime ka ndị mba ọzọ nwee nrube isi nke okwukwe nʼetiti ha nʼihi aha ya.
ROM 1:6 Tinyere unu onwe unu ndị ahụ a kpọrọ ka ha bụrụ ndị nke Jisọs Kraịst.
ROM 1:7 Ya bụ, unu ndị Chineke hụrụ nʼanya bi na Rom, ndị ọ kpọrọ ka ha bụrụ ndị nsọ: Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
ROM 1:8 Na mbụ, ana m ekele Chineke ekele nʼihi unu niile, site nʼaha Jisọs Kraịst. Nʼihi na a na-ekwusa ihe banyere okwukwe unu nʼụwa niile.
ROM 1:9 Chineke, onye m na-ejere ozi, nʼime mmụọ site na ikwusa oziọma nke Ọkpara ya, bụ onye akaebe na m na-echeta unu mgbe niile nʼekpere m.
ROM 1:10 Nʼekpere m oge niile, a na m arịọ ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee na site nʼike Chineke, aga m enwe ohere ịbịa leta unu.
ROM 1:11 Ọ na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nʼihi na achọrọ m ka unu keta oke nʼonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzosi ike nʼokwukwe.
ROM 1:12 Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume site nʼokwukwe anyị.
ROM 1:13 Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata na atụọla m atụmatụ ịbịa leta unu ọtụtụ mgbe (ma tutu ruo ugbu a e gbochiri m ịbịa), ka m nwee ike nweta mkpụrụ nʼetiti unu, dịka m nwere nʼetiti ndị mba ọzọ.
ROM 1:14 Nʼihi na abụ m onye ji ụgwọ nye ndị Griik na ndị mba ọzọ, nyekwa ndị maara ihe na ndị nzuzu.
ROM 1:15 Ya mere m ji dị njikere ikwusa oziọma nyekwa unu bụ ndị bi na Rom.
ROM 1:16 Nʼihi na ihere oziọma ahụ anaghị eme m, nʼihi na ọ bụ ike Chineke na-ewetara onye ọbụla kwere na ya nzọpụta, nye onye Juu na mbụ nakwa nye onye Griik.
ROM 1:17 Nʼihi na ọ bụ nʼoziọma ka e kpughere ezi omume Chineke, ezi omume nke na-esite nʼokwukwe ruo okwukwe. Dịka e siri dee ya, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.”
ROM 1:18 Nʼihi na e sitela nʼeluigwe kpughe ọnụma Chineke megide mmehie na ajọ omume niile nke ndị na-emebi iwu, ndị na-esite nʼajọ omume ha na-eguzogide eziokwu ahụ.
ROM 1:19 Nʼihi na ndị a maara ihe ha kwesiri ịmata banyere Chineke. Ha maara ya nʼihi na Chineke nʼonwe ya emeela ka o doo ha anya.
ROM 1:20 Nʼihi na site nʼoge Chineke kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya, ụdịdị ya nke a na-apụghị ịhụ anya na ike nke ebighị ebi ya na ụdịdị ịdị nsọ ya ka e mere ka ọ pụta ìhè nye ụmụ mmadụ. Ụmụ mmadụ na-aghọta ihe ndị a site nʼihe ndị e kere eke. Nʼihi nke a ụmụ mmadụ enwekwaghị ngọpụ.
ROM 1:21 Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị.
ROM 1:22 Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu.
ROM 1:23 Kama ife Chineke na-adịghị anwụ anwụ ofufe, ha weere otuto ha kwesiri inye ya nye ihe ndị ahụ ha jiri aka ha kpụọ. Ihe ndị a yiri mmadụ na-anwụ anwụ, na nnụnụ, na ụmụ anụmanụ, na ihe na-akpụ akpụ nʼala.
ROM 1:24 Nʼihi ya, Chineke hapụrụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ nye adịghị ọcha nke ịkwa iko, ha jikwa ahụ ha emerịta mpu nʼetiti onwe ha.
ROM 1:25 Ha were okwu ụgha dochie nʼọnọdụ eziokwu banyere Chineke. Ha na-asọpụrụ, na-efekwa ihe e kere eke, ma hapụ Onye okike, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen.
ROM 1:26 Ọ bụ nke a mere Chineke jiri nyefee ha nʼaka agụụ anụ ahụ nke na-eme ihere. Nʼihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nʼụzọ na-ezighị ezi.
ROM 1:27 Ọzọkwa, kama ha na ndị inyom inwe mmekọrịta; ndị ikom ha họọrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta nke ha na ndị inyom kwesiri inwe. Nwoke na-edinakwuru nwoke ibe ya. Nʼụzọ dị otu a, ha natakwara ntaramahụhụ kwesiri ha nʼihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme.
ROM 1:28 Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chineke nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ niile nke ajọ echiche obi ha chepụtara.
ROM 1:29 Ha jupụtara nʼajọ omume na mmehie niile, anya ukwu na aghụghọ. Ha jupụtakwara nʼekworo, na igbu mmadụ, na esemokwu, na uche gbagọrọ agbagọ na ịkpọ asị. Ha bụ ndị na-ekwu okwu azụ,
ROM 1:30 na ndị nkwutọ na ndị kpọrọ Chineke asị, na ndị na-akparị mmadụ na ndị mpako na ndị na-anya isi. Ha na-atụpụta ụzọ ọhụrụ ime ihe ọjọọ, ha adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha.
ROM 1:31 Ha bụkwa ndị na-enweghị nghọta, ndị na-enweghị okwukwe, ndị obi ọjọọ na ndị na-enweghị obi ebere.
ROM 1:32 Ha maa na Chineke nyere iwu dị ike na ndị na-ebi ndụ dị otu a kwesiri ọnwụ, ma ha gara nʼihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalịkwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.
ROM 2:1 Nʼihi ya, ị nweghị ngọpụ, onye ọbụla ị bụ, mgbe ị na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Nʼihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, ọ bụ onwe gị ka ị na-ama ikpe maka na gị onwe gị na-emekwa ụdị ihe ndị ahụ.
ROM 2:2 Ma anyị maara na Chineke na-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a ikpe nʼụzọ ziri ezi.
ROM 2:3 Gị bụ mmadụ, gịnị mere i ji na-ama ndị na-eme ihe dị otu a ikpe mgbe gị onwe gị na-eme otu ihe ahụ. I chere na ị ga-agbanarị ikpe Chineke?
ROM 2:4 Ka ị na-eleda obiọma Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachiobi ya anya? Ị maghị na obiọma Chineke nwere nʼebe ị nọ kwesiri ime ka i site na mmehie gị chegharịa?
ROM 2:5 Ma nʼihi isiike gị na obi gị kpọrọ nkụ nke enweghị nchegharị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma nke Chineke nʼụbọchị oke iwe ya, mgbe a ga-ekpughe ikpe ya ziri ezi.
ROM 2:6 Ọ ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya siri dị.
ROM 2:7 Chineke ga-enye ndị niile sitere na ntachiobi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide bụ ndụ ebighị ebi.
ROM 2:8 Ma ndị niile na-akpa iche iche, ndị jụkwara isoro eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka a ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma.
ROM 2:9 Nsogbu na iru ụjụ ga-abịakwasị ndị niile na-eme ihe ọjọọ, mbụ, ọ ga-adịrị ndị Juu, emechaa, ọ ga-adịkwara ndị mba ọzọ.
ROM 2:10 Ma otuto na nsọpụrụ na udo ga-abụ nke onye ọbụla na-eme ezi ihe, malite nʼonye Juu ruokwa na ndị mba ọzọ.
ROM 2:11 Nʼihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nʼihu.
ROM 2:12 Ndị niile mehiere nʼọnọdụ enweghị iwu ga-ala nʼiyi nʼọnọdụ enweghị iwu. Ma ndị niile mehiere megide iwu ahụ ha mara ihe banyere ya ka a ga-ama ikpe dịka iwu siri kwuo.
ROM 2:13 Nʼihi na ọ bụghị ndị ahụ na-anụ mgbe a na-agụpụta akwụkwọ iwu ka a na-agụ dịka ndị ezi omume nʼihu Chineke, kama ọ bụ ndị ahụ niile na-eme ihe iwu kwuru ka a ga-agụ ka ndị ezi omume.
ROM 2:14 Nʼezie, mgbe ndị mba ọzọ bụ ndị na-enweghị iwu sitere nʼobi ha mee ihe iwu kwuru, o gosiri na ha bụ iwu nye onwe ha, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu ahụ e dere ede.
ROM 2:15 Ha na-egosipụta na edeela ihe ndị ahụ iwu kwuru nʼobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ụfọdụ, ma na-agọpụrụ ha mgbe ụfọdụ.
ROM 2:16 Dịka oziọma ahụ m na-ekwusa si kwuo, Chineke ga-ekpe ndụ nzuzo niile ụmụ mmadụ na-ebi ikpe, site na Kraịst Jisọs.
ROM 2:17 Ma ugbu a, gị onye na-akpọ onwe gị onye Juu, onye tụkwasịrị obi gị nʼiwu ahụ, onye na-anyakwa isi na ị maara Chineke,
ROM 2:18 ọ bụrụ na ị mara uche ya ma kwenyekwa nʼihe nke ka mma nʼihi na e ziri gị ihe site nʼiwu;
ROM 2:19 ọ bụrụ na o doro gị anya na ị bụ onyendu nye ndị ìsì, bụrụkwa ìhè nye ndị nọ nʼọchịchịrị,
ROM 2:20 ị na-agụkwa onwe gị dịka onye nkuzi nke ndị na-amaghị ihe, na onye nkuzi ụmụntakịrị, nʼihi na ị maara iwu nke ọma, jupụtakwa nʼamamihe na eziokwu.
ROM 2:21 Gị onye na-akụziri mmadụ ibe gị ihe, ị na-akụzikwara onwe gị? Gị onye na-ekwusa ka mmadụ ezula ohi, ị na-ezu ohi?
ROM 2:22 Gị onye na-asị mmadụ akwala iko, ị na-akwa iko? Gị onye na-akpọ arụsị ihe arụ, ị na-ezuru ihe dị nʼụlọ arụsị nʼohi?
ROM 2:23 Gị onye na-anya isi na ị maara iwu, ị na-emenye Chineke ihere site nʼimebi iwu ahụ?
ROM 2:24 Dịka esi dee ya, “Ndị mba ọzọ na-ekwulu aha Chineke nʼihi unu.”
ROM 2:25 Obibi ugwu bara uru nʼezie ma ọ bụrụ na ị na-edebe iwu, ma ọ bụrụ na ị na-emebi iwu, obibi ugwu gị dịka mgbe i bighị ugwu.
ROM 2:26 Ọ bụrụ na ndị e bighị ugwu na-edebe ihe iwu kwuru, ọ bụ na a gaghị agụ ebighị ugwu ha dịka obibi ugwu?
ROM 2:27 Ya bụ, ndị ahụ a na-ebighị ugwu nʼanụ ahụ ma na-edebe iwu ga-ama unu ikpe, bụ ndị nwere iwu ahụ e dere nʼakwụkwọ na ndị e bikwara ugwu ma na-emebi iwu.
ROM 2:28 Ị bụ ezigbo onye Juu abụghị nke elu ahụ. Ezigbo ibi ugwu abụkwaghị ihe a na-ahụ nʼanụ ahụ.
ROM 2:29 Kama ezigbo onye Juu bụ onye ọbụla nke bụ ya nʼime mmụọ. Ezigbo obibi ugwu bụkwa nke ime obi, nke mmụọ, ọ bụghị nke e dere ede. Otuto ya esiteghị nʼaka mmadụ kama o sitere nʼaka Chineke.
ROM 3:1 Ọ dị uru pụrụ iche mmadụ nwere nʼihi na ọ bụ onye Juu? Gịnị bụkwa uru ahụ dị ukwuu nke dị na-ebiri mmadụ ugwu?
ROM 3:2 Ọ bara uru nʼụzọ niile. Nke mbụ, ọ bụ ndị Juu ka e weere okwu Chineke nyefee nʼaka.
ROM 3:3 Gịnị ga-emezi ma ọ bụrụ na ụfọdụ nʼime ha ekwesighị ntụkwasị obi? Chineke, ọ ga-eji nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha ghara ikwesi ntụkwasị obi?
ROM 3:4 Ọ pụghị ịdị otu a! Kama ka ọ bụrụ ihe pụtara ihe na Chineke bụ onye eziokwu, ma mmadụ niile bụ ndị okwu ụgha, dịka e dere ya, “Ka e nwe ike gosipụta na ị na-ekwu eziokwu mgbe ọbụla i kwuru okwu, na ekpegbukwa mgbe i na-ekpe ikpe.”
ROM 3:5 Ma ọ bụrụ na ajọ omume anyị na-eme ka ezi omume Chineke pụta ìhè, gịnị ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na Chineke adịghị eme ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na ọ taa anyị ahụhụ nʼihi ajọ omume anyị? (Ana m ekwu okwu a dị ka ndị mmadụ.)
ROM 3:6 Nʼezie, ọ bụghị otu a, ọ bụrụ na ọ bụ otu a, oleekwanụ otu Chineke ga-esi kpee ụwa ikpe?
ROM 3:7 Otu onye nwere ike ị sị, “na ọ bụrụ na a na-esite nʼokwu ụgha m, mee ka eziokwu nke Chineke pụta ìhè karịa, na-ewetara Chineke otuto, gịnị mere e ji ama m ikpe dịka onye mmehie?”
ROM 3:8 Ọ pụtara na anyị ga-asị, “ka anyị na-eme ihe ọjọọ ka ezi ihe si na ya pụta”? Ụfọdụ ndị mmadụ ji nkwutọ na-ebo m ebubo na m na-akụzi ihe dị otu a, ikpe a mara ha kwesiri ekwesi.
ROM 3:9 Gịnị kwanụ? Anyị ọ ka ha mma? Mba, ma e meela ya rịị ka ọ pụta ìhè na mmadụ niile nọ nʼokpuru mmehie, ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ.
ROM 3:10 Dịka e dere ya, “Ọ dịghị onye ọbụla bụ onye ezi omume, ọ dịghị ọ bụladị otu onye.
ROM 3:11 Ọ dịghị onye ọbụla na-aghọta, ọ dịkwaghị onye ọ na-agụ ịchọ Chineke.
ROM 3:12 Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile, ọ dịghị onye bara uru nʼime ha. Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma, a pụghị ịchọta ọ bụladị otu onye.
ROM 3:13 Akpịrị ha bụ ili ghere oghe, ha ji ire ha na-aghọ aghụghọ. Elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha.
ROM 3:14 Ọnụ ha jupụtara nʼokwu na-akụ ilu na ọbụbụ ọnụ.
ROM 3:15 Ụkwụ ha na-eme ọsịịsọ ịkwafu ọbara.
ROM 3:16 Mbibi na nhụju anya dị nʼụzọ ha niile.
ROM 3:17 Ha amaghị ihe bụ ụzọ udo.
ROM 3:18 Ha amatabeghị ihe ịtụ egwu Chineke pụtara.”
ROM 3:19 Ugbu a, anyị maara na ihe ọbụla iwu kwuru, ọ bụ ndị nọ nʼokpuru iwu ka ọ dịịrị, ka esite otu a kpuchite ọnụ niile nʼotu nʼotu. Ma meekwa ka ụwa niile mata na ha bụ ndị ikpe mara nʼebe Chineke nọ.
ROM 3:20 Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke maka na ọ na-edebe iwu. Kama, ọ bụ site nʼiwu ka anyị ji mata ihe banyere mmehie.
ROM 3:21 Ma ugbu a, emeela ka ezi omume Chineke pụta ìhè, site nʼiguzo iche nʼebe iwu dị, bụ nke iwu na ndị amụma gbakwara ama ya.
ROM 3:22 Ezi omume a na-esite nʼebe Chineke nọ abịa, site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst nye ndị niile kweere. O nweghị ihe ịdị iche ọbụla dị na ya.
ROM 3:23 Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto Chineke.
ROM 3:24 Ma ugbu a, agụọla ha na ndị ezi omume site nʼamara ya, site na mgbapụta nke si nʼaka Kraịst Jisọs.
ROM 3:25 Onye Chineke họpụtara ka o were ndụ ya chụọ aja ikpuchi mmehie, site nʼiwufu ọbara ya maka mgbaghara mmehie, nke a ga-anata site nʼokwukwe. Nʼụzọ dị otu a, ọ na-egosipụta ezi omume ya, maka oge gara aga, nʼihi nnagide ya, o jiri ndidi leghara mmehie ụmụ mmadụ anya.
ROM 3:26 Ma nʼoge taa, site nʼigosi na ya onwe ya bụ onye ezi omume, na onye a na-agụnye dịka onye ezi omume bụ onye nke kweere na Jisọs.
ROM 3:27 Mgbe o si otu a dịrị, olee ebe ịnya isi anyị dịkwa? Ajụla ịnabata ya. Ọ bụ site iwu dị aṅa? Ọ bụ nke ọrụ? Mba, kama ọ bụ site nʼokwukwe anyị nwere nʼime Kraịst.
ROM 3:28 Ya mere, anyị na-agụnye mmadụ nʼonye ezi omume nʼihi okwukwe o nwere, ọ bụghị nʼihi na o mere ihe iwu kwuru.
ROM 3:29 Chineke ọ bụ naanị nke ndị Juu? Ọ bụkwaghị nke ndị mba ọzọ? Nʼezie, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ.
ROM 3:30 Nʼihi na Chineke dị naanị otu, ọ bụ site nʼokwukwe ka ọ ga-anabata ndị ahụ ebiri ugwu, sitekwa nʼotu okwukwe ahụ gụọ ndị a na-ebighị ugwu ka ndị ezi omume.
ROM 3:31 Ọ bụrụ na ọ dị otu a, anyị na-esite nʼokwukwe anyị mee ka iwu ghara ịdị ire? Mba! Kama anyị na-enye iwu ọnọdụ kwesiri ya.
ROM 4:1 Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Ebraham, nna nna anyị na o nwetara ihe niile site nʼanụ ahụ?
ROM 4:2 A sị na a gụrụ Ebraham dịka onye ezi omume site nʼọrụ aka ya, ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji anya isi, ma na ọ bụghị nʼihu Chineke.
ROM 4:3 Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.”
ROM 4:4 Mgbe mmadụ rụrụ ọrụ, ụgwọ ọrụ a kwụrụ ya abụghị onyinye, kama ọ bụ ihe ruru ya nʼihi ọrụ ọ rụrụ.
ROM 4:5 Ma nye onye na-enweghị ọrụ ma tinye okwukwe ya na onye ahụ na-agụnye ndị ajọọ omume dịka ndị ezi omume, a ga-eji okwukwe ya gụnyere ya dịka ezi omume.
ROM 4:6 Devid nʼonwe ya kwukwara banyere ọṅụ dịịrị onye ọbụla Chineke gụrụ nʼonye ezi omume nʼagbanyeghị ọrụ ya.
ROM 4:7 “Ngọzị na-adịrị ndị a gbaghaara ajọ omume ha niile, ndị ekpuchikwara mmehie ha niile.
ROM 4:8 Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya.”
ROM 4:9 Ngọzị a ọ dịrị naanị ndị e biri ugwu ka ọ bụ nyekwa ndị a na-ebighị ugwu? Ihe anyị na-ekwu bụ na a gụrụ okwukwe Ebraham dị ka ezi omume nye ya.
ROM 4:10 Olee mgbe a gụrụ ya nye ya? Ọ bụ tupu e bie ya ugwu, ka ọ bụ mgbe e bichara ya ugwu? Ọ bụghị mgbe e bichara ya ugwu kama ọ bụ tupu e bie ya ugwu.
ROM 4:11 Ọ natara ihe ịrịbama nke obibi ugwu dịka akara nke ezi omume nke okwukwe o nwere mgbe ọ nọ na-ebighị ugwu. Nke a bụ ime ya nna ndị niile kweerenụ, ndị ahụ ọ gụrụ dịka ndị ezi omume, ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu.
ROM 4:12 Nʼụzọ dị otu a kwa, ọ bụ nna ndị niile e biri ugwu. Ndụ ya na-egosikwa ha na ọ bụghị obibi ugwu ha na-azọpụta ha, kama ọ bụ okwukwe ha. Nʼihi na Chineke nabatara Ebraham naanị site nʼokwukwe o nwere tupu e bie ya ugwu.
ROM 4:13 Nkwa o kwere Ebraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site nʼidebe iwu, kama ọ bụ site nʼezi omume nke okwukwe.
ROM 4:14 Nʼihi na, ọ bụrụ na ndị a ga-enye ihe e kwere na nkwa bụ ndị na-edebe iwu, inwe okwukwe abakwaghị uru, nkwa ahụ enwekwaghị isi ọbụla.
ROM 4:15 Nʼihi na iwu nʼonwe ya na-eme ka ọnụma bịa. Ma ebe iwu na-adịghị, mmehie adịghịkwa.
ROM 4:16 Ya mere, nkwa ahụ na-abịa site nʼokwukwe, ka ọ bụrụ naanị site nʼamara ka e ji mee ka ụmụ ya niile nweta ya, ọ bụghị naanị nye ndị nọ nʼokpuru iwu, kama ọ bụkwa nye ndị nwere ụdị okwukwe Ebraham. Nʼihi na ọ bụ nna anyị niile.
ROM 4:17 Dịka e dere ya, “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.” Ya mere, nʼihu Chineke ahụ bụ onye o kweenyere nʼime ya, bụ onye ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịbụghị, mee ka ha dịrị.
ROM 4:18 Ọ bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị.”
ROM 4:19 Ọ daghị mba nʼokwukwe ọ bụladị mgbe ọ matara na ya akala nka nʼahụ, nʼihi na ọ gbaruola otu narị afọ, tinyekwara na akpanwa Sera bụ ihe nwụrụ anwụ.
ROM 4:20 Ọ dịghị mgbe ọbụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe niile o kwere ya na nkwa. Kama, okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na-enye Chineke otuto.
ROM 4:21 O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe niile ọbụla o kwere na nkwa.
ROM 4:22 Ọ bụ nʼihi ya ka e ji gụọ nke a nye ya dị ka ezi omume.
ROM 4:23 Okwu ndị a, “A gụrụ ya nye ya dịka onye ezi omume,” edeghị ya naanị maka ya.
ROM 4:24 Kama e dere ya nʼihi anyị bụ ndị kwere nʼonye ahụ mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie.
ROM 4:25 Onye a rara nye ka ọ nwụọ nʼihi mmehie anyị niile, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie ka anyị bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ezi omume.
ROM 5:1 Ya mere, ebe e sitere nʼokwukwe mee ka anyị bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ezi omume, udo dị ugbu a nʼetiti anyị na Chineke site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
ROM 5:2 Onye anyị sitere nʼaka ya nata amara nke anyị na-eguzo nʼime ya ugbu a. Anyị nọ nʼọṅụ nweekwa olileanya na a ga-eme ka anyị keta oke nʼebube Chineke.
ROM 5:3 Ọ bụkwaghị naanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime nsogbu anyị niile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachiobi.
ROM 5:4 Ntachiobi na-arụpụta nʼime anyị ezi agwa; ezi agwa na-arụpụtakwa olileanya.
ROM 5:5 Olileanya na-eme ka anyị guzo chịm, nʼihi na Chineke awụnyela ịhụnanya ya nʼime obi anyị site nʼonyinye Mmụọ Nsọ.
ROM 5:6 Mgbe ahụ anyị na-enweghị ike ọbụla, mgbe oge ahụ ruru nnọọ, Kraịst bịara nwụọ ọnwụ nʼihi anyị bụ ndị mmehie.
ROM 5:7 A sịkwarị na anyị bụ ndị ezi omume ọ gaara abụ ihe siri ike mmadụ ịbịa nwụọ ọnwụ nʼihi anyị. Ma eleghị anya, a ga-ahụkwa onye nwere ike nwụọ nʼihi ezi mmadụ.
ROM 5:8 Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrịị na-eme mmehie, Kraịst nwụrụ nʼihi anyị.
ROM 5:9 Ebe a gụrụ anyị dịka ndị ezi omume site nʼọbara ya, nke karịrị nke a, a ga-esitekwa na ya zọpụta anyị site nʼọnụma Chineke.
ROM 5:10 Nʼihi na, ọ bụrụ na mgbe anyị bụ ndị iro Chineke, e mere ka anyị na ya dị nʼudo site nʼọnwụ Ọkpara ya, nke karịrị nke a bụ, ebe ọ bụ na anyị na ya dịzi na mma, anyị ga-enweta nzọpụta site na ndụ ya.
ROM 5:11 Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime Chineke site na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye anyị sitere na ya nata ịdị na mma a ugbu a.
ROM 5:12 Dịka o siri dị, ọ bụ site nʼaka otu nwoke ka mmehie siri bata nʼụwa. Ọ bụkwa mmehie a wetara ọnwụ. Ugbu a, ọnwụ erutela onye ọbụla aka nʼihi na mmadụ niile emehiela.
ROM 5:13 Ma tupu e nye iwu, mmehie dị nʼụwa. Ma a dịghị agụkọta mmehie mgbe iwu na-adịghị.
ROM 5:14 Ma e mere ka ọnwụ rute onye ọbụla site nʼoge Adam ruo nʼoge Mosis. O metụtara ọ bụladị ndị mmehie ha na-adịghị ka nke Adam, onye bụ ihe atụ nke onye ahụ gaje ịbịa.
ROM 5:15 Ma onyinye a adịghị ka njehie ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ọtụtụ nwụrụ site na mmehie nke otu mmadụ, lee ka o siri bụrụ ihe dị ukwu karịa na amara Chineke na onyinye amara sitere nʼotu onye bụ Jisọs Kraịst ga-ababiga ụba oke rute ọtụtụ mmadụ.
ROM 5:16 Ọzọ, onyinye a adịghị ka ihe mmehie mmadụ mụpụtara. Nʼihi na ikpe ahụ sooro mmehie otu onye weta ọmụma ikpe, ma onyinye ahụ sooro ọtụtụ njehie weta ịgụ mmadụ nʼonye ikpe na-amaghị.
ROM 5:17 Ya mere, ọ bụrụ na ọnwụ chịrị ọchịchị site na njehie nke otu onye, ọ bụghị ihe dị ukwu karịa na ndị nabatara onyinye amara Chineke bara ụba, ya na onyinye ezi omume, ga-achị achị na ndụ site nʼotu onye ahụ bụ Jisọs Kraịst.
ROM 5:18 Ya mere, dịka otu njehie si weta ikpe ọmụma nye mmadụ niile, otu ahụ kwa ka e si gụọ mmadụ niile dịka ndị ezi omume na ndị nwere ndụ site nʼotu ọrụ ezi omume.
ROM 5:19 Nʼihi na dịka ọtụtụ mmadụ si bụrụ ndị mmehie nʼihi nnupu isi nke otu nwoke, otu a kwa ka ọtụtụ mmadụ ga-abụkwa ndị ezi omume nʼihi nrube isi nke otu nwoke.
ROM 5:20 Iwu bịara mee ka mmehie na-aba ụba, ma dịka mmehie na-aba ụba, amara na-abakwa ụba karịa.
ROM 5:21 Ya mere, dịka mmehie si bụrụ eze nʼọnwụ, otu a kwa ka amara ga-esi bụrụ eze site nʼezi omume iweta ndụ ebighị ebi site nʼaka Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị.
ROM 6:1 Gịnị ọzọkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-anọgide nʼime mmehie ka amara na-aba ụba?
ROM 6:2 E e! O kwesighị! Olee otu anyị ga-esi na-adị ndụ nʼime mmehie, mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị?
ROM 6:3 Ọ bụ na unu amataghị na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtakwara anyị na ya nʼọnwụ.
ROM 6:4 Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ.
ROM 6:5 Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ.
ROM 6:6 Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie.
ROM 6:7 Nʼihi na onye nwụrụ anwụ agụọla ya dịka onye nwere onwe ya site nʼebe mmehie dị.
ROM 6:8 Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ.
ROM 6:9 Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe ọ nọ ọzọ.
ROM 6:10 Ọ nwụrụ naanị otu mgbe nʼihi mmehie. Ma ndụ ọ na-adị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke.
ROM 6:11 Ya mere, gụọ onwe unu ugbu a dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dịka ndị dị ndụ nʼebe Chineke nọ nʼime Kraịst, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.
ROM 6:12 Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi.
ROM 6:13 Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume.
ROM 6:14 Nʼihi na unu ekwesighị ị bụ ohu mmehie, ebe ọ bụ na unu anọkwaghị nʼokpuru iwu ọzọ, kama unu nọ nʼokpuru amara.
ROM 6:15 Gịnịkwa? Anyị ga-eme mmehie nʼihi na anyị anọghị nʼokpuru iwu kama nʼokpuru amara? Mba! O kwesighị.
ROM 6:16 Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume?
ROM 6:17 Ma ekele dịrị Chineke nʼihi na ọ bụ ezie na unu bụrịị ohu nye mmehie, ma ugbu a, unu ejirila obi unu niile kpebie ịnabatara onwe unu ozizi ahụ e nyefere nʼaka unu.
ROM 6:18 Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie, unu abụrụla ndị ohu ezi omume.
ROM 6:19 Ana m eji ihe ịmaatụ site na ndụ a na-ebi kwa ụbọchị, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ mmadụ. Ya mere, dịka unu si were ahụ unu dị iche iche nye ịbụ ohu adịghị ọcha na ajọ omume nke na-abawanye ụba, sitekwanụ otu a were ha nye ugbu a ka ha bụrụ ohu ezi omume nke na-eduba nʼịdị nsọ.
ROM 6:20 Mgbe unu bụ ohu mmehie, o nweghị ihe megidere unu ime ezi omume.
ROM 6:21 Ma gịnị bụ uru unu nwetara nʼoge ahụ site nʼọrụ ahụ niile unu rụrụ, bụ ihe ndị ahụ na-eme ka ihere mee unu? Ihe ndị ahụ na-eduba nʼọnwụ.
ROM 6:22 Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi.
ROM 6:23 Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.
ROM 7:1 Ọ bụ na unu amaghị ụmụnna m, unu ndị maara iwu nke ọma na ọ bụ oge mmadụ dị ndụ ka iwu na-ejide ya?
ROM 7:2 Dịka ihe ịmaatụ, iwu na-ejikọta nwanyị lụrụ di na di ya mgbe di ya ka nọ ndụ, ma ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, ọ nọkwaghị nʼokpuru iwu jikọtara ha dịka di na nwunye.
ROM 7:3 A ga-akpọ ya nwanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ lakwuru nwoke ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ. Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼiwu ahụ. Ọ kwaghị iko ma ọ bụrụ na ọ lụọ nwoke ọzọ.
ROM 7:4 Ya mere, ụmụnna m, unu onwe unu kwa anwụọla nʼebe iwu dị site nʼahụ Kraịst, ka e nwe ike kenye unu onye ọzọ, bụ onye ahụ e mere ka o si nʼọnwụ bilie. Ka anyị site na ya mịa mkpụrụ nye Chineke.
ROM 7:5 Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị anyị, ọchịchọ ọjọọ nke iwu na-akpali jupụtara nʼime anyị, nke mere na anyị na-amị mkpụrụ nye ọnwụ.
ROM 7:6 Ugbu a, a tọghapụla anyị pụọ nʼaka iwu ebe anyị nwụrụ nye ihe ndị kere anyị agbụ na mbụ, anyị anaghị ebikwa ndụ nʼusoro iwu ochie nke e dere nʼakwụkwọ, kama anyị na-eje ozi nʼusoro ndụ ọhụrụ nke mmụọ.
ROM 7:7 Ugbu a, gịnị ka anyị ga-ekwu? Iwu ahụ ọ bụ mmehie? Nʼezie, mbaa! Agaraghị m ama ihe mmehie bụ ma ọ bụghị site nʼiwu. Ọ bụrụ na iwu asịghị, “Enwela anya ukwu,” agaraghị m ama na ọ bụ mmehie.
ROM 7:8 Ma mmehie sitere nʼiwu a megidere ọchịchọ ọjọọ, mee ka echiche m mgbe niile bụrụ ihe gbasara ihe ọjọọ, na otu m ga-esi mee ha. A sị na iwu adịghị, mmehie agaraghị adị.
ROM 7:9 Na mbụ, abụ m onye dị ndụ mgbe iwu na-adịghị, ma mgbe iwu bịara, e mere ka mmehie nwe ntute.
ROM 7:10 Anwụrụ m, ma chọpụta na iwu ahụ kwesiri iwetara m ndụ ghọziri ihe wetara ọnwụ.
ROM 7:11 Nʼihi na mmehie jiri ohere ahụ iwu webatara ghọgbuo m, sitekwa nʼiwu ahụ gbuo m.
ROM 7:12 Nʼezie, iwu ahụ dị nsọ, ihe e nyere nʼiwu dị nsọ, bụrụkwa ezi omume na ihe dị mma.
ROM 7:13 Mgbe ahụ, ọ pụtara na ihe ahụ dị mma wetaara m ọnwụ? Mba! Kama ọ bụ mmehie sitere nʼihe dị mma wetara m ọnwụ, ka e nwee ike gosipụta na mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya site nʼihe e nyere nʼiwu.
ROM 7:14 Anyị matara na iwu bụ ihe nke mmụọ ebe mụ onwe m bụ anụ ahụ efu, onye e rere dịka ohu nye mmehie.
ROM 7:15 O nweghị ụzọ ihe m na-eme si doo m anya. Nʼihi na ihe m na-eme abụghị ihe m chọrọ ime, ọ bụ ihe m kpọrọ asị bụ ihe na-agara m aka ime mgbe niile.
ROM 7:16 Ma ọ bụrụ na m eme ihe m na-achọghị ime, ana m ekwenye na iwu dị mma.
ROM 7:17 Ma dịka ọ dị, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ mmehie bi nʼime m.
ROM 7:18 O doro m anya na o nweghị ihe ọma ọbụla dị nʼime m, ya bụ nʼime anụ ahụ m. Nʼihi na ọ na-agụ m agụụ ime ezi ihe, ma ike ime ezi ihe adịghị nʼime m.
ROM 7:19 Ihe m na-eme mgbe m chọrọ ime ezi ihe abụghị ezi ihe ahụ m chọrọ ime kama ọ bụ ajọọ ihe ahụ m na-achọghị ime ka m na-eme.
ROM 7:20 Ọ bụrụ na m na-eme ihe ahụ m na-achọghị ime, ọ pụtara na ọ bụghị mụ onwe m na-eme ihe ndị ahụ. Kama ọ bụ mmehie bi nʼime m na-eme ha.
ROM 7:21 Achọpụtara m iwu nke na-arụ ọrụ nʼime m. Mgbe m chọrọ ime ihe ọma, naanị ihe ọjọọ bụ ihe na-agara m aka ime.
ROM 7:22 Nʼime ime onwe m, ọ na-agụ m agụụ ime ihe iwu Chineke kwuru.
ROM 7:23 Ma ana m ahụta iwu ọzọ dị nʼime m nke na-agba mgba megide iwu nke dị nʼuche m, ime ka m bụrụ ohu nye iwu nke mmehie na-arụ ọrụ ya nʼanụ ahụ m.
ROM 7:24 Lee ụdị ọnọdụ ọjọọ nke m hụtara onwe m nʼime ya! Onye pụrụ ịnapụta m site nʼanụ ahụ a nke na-eduba m nʼọnwụ?
ROM 7:25 Ma ekele dịrị Chineke, onye na-anapụta m site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị! Ya mere, nʼime mmụọ m, abụ m odibo nye iwu Chineke, ma nʼime anụ ahụ mmehie m, abụ m ohu nye iwu nke mmehie.
ROM 8:1 Ya mere, ikpe ọmụma ọbụla adịghịkwa ugbu a nye ndị niile nọ nʼime Jisọs Kraịst.
ROM 8:2 Nʼihi na site na Kraịst Jisọs iwu nke Mmụọ na-enye ndụ emeela ka m nwere onwe m site nʼiwu nke mmehie na ọnwụ.
ROM 8:3 Nʼihi na ihe iwu na-enweghị ike ime, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ, ka Chineke mere, site nʼizite Ọkpara ya, ka ọ bịa nʼụdịdị anụ ahụ mmehie, bụrụ aja mmehie, site otu a, maa mmehie ikpe na anụ ahụ.
ROM 8:4 Ka izu ezu nke ihe niile iwu chọrọ nʼaka anyị bụrụ ihe e mezuru nʼime anyị, bụ ndị na-adịghị ebi ndụ dịka ọchịchọ anụ ahụ si dịrị, kama dịka ọchịchọ Mmụọ Nsọ si dị.
ROM 8:5 Ndị niile na-ebi ndụ ha dịka anụ ahụ siri chọọ, na-ebi ya naanị imezu agụụ niile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị niile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Mmụọ na-achọ.
ROM 8:6 Ịtụkwasị uche nʼihe nke anụ ahụ na-eweta ọnwụ. Ma ịtụkwasị uche nʼihe nke Mmụọ Nsọ na-eweta ndụ na udo.
ROM 8:7 Nʼihi na onye ọbụla tụkwasịrị uche ya nʼihe nke anụ ahụ na-ebuso Chineke agha, ọ naghị edebe iwu nke Chineke. Nʼeziokwu, ọ gaghị enwe ike idebe ya.
ROM 8:8 Ya mere, ndị na-erubere anụ ahụ ha isi apụghị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.
ROM 8:9 Ma lee! Unu onwe unu anaghị ebizi ndụ nʼusoro nke anụ ahụ, kama unu na-ebi nʼusoro nke Mmụọ Nsọ nʼihi na Mmụọ nke Chineke bi nʼime unu. Onye ọbụla na-enweghị Mmụọ nke Kraịst abụghị nke ya.
ROM 8:10 Ọ bụrụkwa na Kraịst bi nʼime unu, anụ ahụ unu ga-abụ ihe nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị, ma mmụọ unu dị ndụ nʼihi na a gụọla unu na ndị ezi omume.
ROM 8:11 Ọ bụrụ na Mmụọ onye mere ka Jisọs si nʼọnwụ bilie, bi nʼime gị, onye ahụ nke mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie ga-emekwa ka anụ ahụ gị dị ndụ site nʼike Mmụọ Nsọ ahụ, onye bi nʼime gị.
ROM 8:12 Ya mere, ụmụnna m, anyị ji ụgwọ ma ọ bụghị anụ ahụ ka anyị ji ụgwọ ịdị ndụ dịka ọchịchọ ya si dị.
ROM 8:13 Ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ dịka anụ ahụ si chọọ, unu ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na unu ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụ ahụ nwụọ, unu ga-adị ndụ.
ROM 8:14 Nʼihi na ndị niile Mmụọ nke Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke.
ROM 8:15 Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ “Abba, Nna.”
ROM 8:16 Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke.
ROM 8:17 Ugbu a, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị nketa oke, ndị ga-eketa ihe Chineke nwere, na ndị ha na Kraịst ga-ekekọta ihe, ma ọ bụrụ nʼezie na anyị ga-esoro ya keta oke ahụhụ ya, ka anyị si otu a sorokwa ya keta oke nʼebube ya.
ROM 8:18 Nʼikwu eziokwu, ahụhụ niile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ebube niile a ga-ekpughe nʼime anyị.
ROM 8:19 Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke.
ROM 8:20 Nʼihi na e tinyere ihe e kere eke nʼọnọdụ ihe na-abaghị uru, ma ọ bụghị site nʼọchịchọ nke onwe ya, kama nʼọchịchọ nke onye ahụ tinyere ya nʼọnọdụ ahụ nʼime olileanya,
ROM 8:21 na otu ụbọchị na ha ga-enwere onwe ha site nʼagbụ nke ire ure, sorokwa keta oke nʼebube ahụ ga-abụ nke ụmụ Chineke.
ROM 8:22 Anyị maara na ruo ugbu a, ihe niile e kere eke na-asụ ude nʼihi ihe mgbu ha nọ nʼime ya, dịka ihe mgbu nke ọmụmụ nwa.
ROM 8:23 Ọ bụghị naanị nke a, ma anyị onwe anyị, ndị nwere mkpụrụ mbụ nke Mmụọ Nsọ, na-asụkwa ude nʼime onwe anyị, na-echesi ike mgbe a ga-akpọbata anyị dịka ụmụ, mgbe a ga-agbapụta anụ ahụ anyị.
ROM 8:24 Nʼihi na a zọpụtara anyị site nʼolileanya dị otu a. Ma olileanya a na-ahụ anya abụghị olileanya. Onye na-enwe olileanya mgbe ihe ọ na-ele anya ya dị ya nʼaka?
ROM 8:25 Ma ọ bụrụ na olileanya anyị dabeere nʼihe ahụ anyị na-enwetabeghị, anyị ga-eji ndidi chere tutu ihe ahụ erute anyị aka.
ROM 8:26 Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nʼime adịghị ike anyị. Nʼihi na anyị amaghị ka esi ekpe ekpere dịka o kwesiri. Ma Mmụọ Nsọ nʼonwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ.
ROM 8:27 Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bụ nʼuche. Nʼihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ.
ROM 8:28 Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị.
ROM 8:29 Nʼihi na ndị ahụ ọ maararị ka ọ kakwara akara ka ha nwe ụdịdị nke Ọkpara ya, ka ọ bụrụ nwa e buru ụzọ mụọ nʼetiti ọtụtụ ụmụnna.
ROM 8:30 Ma ndị ahụ ọ kara akara, ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọrọ, ka ọ gụrụ na ndị ezi omume; ndị ọ gụrụ na ndị ezi omume ka o nyekwara otuto.
ROM 8:31 Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị?
ROM 8:32 Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, kama o weere ya nye nʼihi mmehie anyị niile, ọ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị site na ya?
ROM 8:33 Onye pụrụ ibo ndị ahụ Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụ Chineke na-agụ mmadụ dịka onye ezi omume.
ROM 8:34 Onye bụ onye ahụ nke ga-ama ikpe? Ọ bụ Kraịst Jisọs onye nwụrụ, ma karịa nke ahụ, onye e mere ka o si nʼọnwụ bilie, nọ nʼaka nri Chineke na-arịọtakwara anyị arịrịọ.
ROM 8:35 Onye nwere ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Kraịst? Ọ bụ nsogbu, ka ọ bụ ihe isi ike, ka ọ bụ mkpagbu. Ka ọ bụ ụnwụ, ka ọ bụ ịgba ọtọ, ka ọ bụ ihe egwu, ka ọ bụ mma agha?
ROM 8:36 Dịka e dere ya, “Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.”
ROM 8:37 Mba, kama nʼime ihe ndị a niile, anyị karịrị ndị mmeri site nʼonye ahụ hụrụ anyị nʼanya.
ROM 8:38 Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa,
ROM 8:39 maọbụ ịdị elu, maọbụ ịdị omimi, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.
ROM 9:1 Ana m ekwu eziokwu nʼime Kraịst. Anaghị m ekwu okwu ụgha. Akọnuche m nke Mmụọ Nsọ na-achị na-agbakwara m ama.
ROM 9:2 A nọ m nʼọnọdụ oke ihe mwute na ihe mgbu dị ukwuu nʼobi m.
ROM 9:3 A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe mee, ejikeere m ịbụ onye a bụrụ ọnụ na onye e wepụrụ site nʼebe Kraịst nọ nʼihi ụmụnna m na ndị ikwu m,
ROM 9:4 bụ ndị Izrel. Ndị Chineke họọrọ ka ha bụrụ ụmụ ya, ndị o nyere ebube ya na ọgbụgba ndụ ya. O nyekwara ha iwu na ife ofufe nʼụlọnsọ ukwu ahụ na ọtụtụ nkwa dị iche iche.
ROM 9:5 Ha si nʼagbụrụ nna nna anyị ochie ha. Kraịst nʼonwe ya, nʼụdịdị mmadụ, sikwa nʼagbụrụ ha pụta, onye bụ Chineke nke ihe niile, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen.
ROM 9:6 Ọ bụghị dị ka a ga-asị na okwu Chineke na-ala azụ. Nʼihi na ọ bụghị onye ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị Izrel bụ onye Izrel.
ROM 9:7 Na ha sitere nʼagbụrụ Ebraham pụta emeghị ka ha bụrụ ụmụ Ebraham nʼezie. Ma nʼakụkụ nke ọzọ, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.”
ROM 9:8 Nke a na-egosi na ọ bụghị ndị niile a mụrụ na-anụ ahụ bụ ụmụ Chineke, kama ụmụ ndị ahụ e kwere na nkwa bụ ndị a na-agụnye dị ka ụmụ Ebraham site na nkwa ahụ.
ROM 9:9 Lee ka e si kwee nkwa ahụ, “Mgbe oge ahụ a kara aka ruru, aga m alọghachi, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.”
ROM 9:10 Ọ bụghị naanị nke a. Ụmụ Ribeka si nʼotu nna, ya bụ nna nna anyị Aịzik.
ROM 9:11 Ma tupu a mụọ ụmụ ejima ndị a, ma ọ bụkwanụ tupu ha emee ihe ọbụla dị mma maọbụ nke dị njọ, iji mee ka ọchịchọ Chineke banyere nhọpụta ha guzoro,
ROM 9:12 ọ bụghị site nʼọrụ kama ọ bụ site nʼonye ahụ nke na-akpọ, nʼihi na a gwara ya sị, “Nke okenye ga-ejere nke nta ozi.”
ROM 9:13 Dịka e dere ya, “Jekọb ka m hụrụ nʼanya ma Ịsọ ka m kpọrọ asị.”
ROM 9:14 Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ bụ onye ajọ omume? Mba!
ROM 9:15 Nʼihi na ọ gwara Mosis, “Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.”
ROM 9:16 Ya mere, ọ dabereghị nʼọchịchọ nke mmadụ maọbụ ịrụsị ọrụ ike ya kama ọ dabere nʼebere Chineke.
ROM 9:17 Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ gwara Fero, “Emere m ka ị bụrụ ihe ị bụ nʼihi nke a, ka m were gị zipụta ike m, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.”
ROM 9:18 Ọ pụtara ihe na ọ bụ naanị ndị Chineke chọrọ ka ọ na-emere ebere, ndị ọ chọkwara ka ọ na-eme ka ha bụrụ ndị obi ha kpọchiri akpọchi.
ROM 9:19 Ma eleghị anya unu pụrụ ịgwa m, “Gịnị kwanụ mere o ji ata anyị ụta? Onye kwanụ pụrụ iguzogide ihe o zubere ime?”
ROM 9:20 Onye ka ị bụ gị mmadụ efu, iji ajụ Chineke ajụjụ? “Nkata mmadụ na-akpa ọ ga-ajụ onye na-akpa ya ajụjụ, ‘Onye sị gị kpaa m otu a?’ ”
ROM 9:21 Otu a kwa, onye ọkpụ ite o nweghị ike isite nʼotu ụrọ ahụ o nwere kpụọ ụdị ite ọbụla masịrị ya, ụfọdụ ite pụrụ iche na ụfọdụ e ji eje ozi nʼụlọ?
ROM 9:22 Ọ bụrụkwanụ na Chineke ekpebie igosi iwe ya na ime ka a mara ike ya site nʼinwe oke ndidi banyere ndị oke iwe ya ga-adakwasị bụ ndị a kwadoro maka mbibi?
ROM 9:23 Ma ọ bụrụkwanụ na o mere nke a iji mee ka ndị ahụ ọ na-emere ebere mata ịba ụba nke ebube ya, bụ ndị o bururị ụzọ kwadoo maka ebube a.
ROM 9:24 Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ?
ROM 9:25 Dịka o kwuru nʼakwụkwọ Hosiya, “Aga m akpọ ha ‘ndị m,’ bụ ndị na-abụghị ndị m. Aga m akpọkwa ya ‘onye m hụrụ nʼanya’ bụ onye m na-ahụghị nʼanya.”
ROM 9:26 Ma, “Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ nke Chineke dị ndụ. ’ ”
ROM 9:27 Aịzaya bere akwa nʼihi ụmụ Izrel, “Ọ bụ ezie na ọnụọgụgụ ụmụ Izrel dịka uzuzu dị nʼakụkụ osimiri, maọbụ naanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta.
ROM 9:28 Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe. Ọ ga-eme ọsịịsọ nʼikpe ahụ ma kpebie ya.”
ROM 9:29 Ọ bụkwa dịka Aịzaya kwuru na mbụ, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ahapụrụghị anyị ụmụ ụmụ, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.”
ROM 9:30 Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na o enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ha gbasoro ezi omume, ma ha natara ya, bụ ezi omume nke sitere nʼokwukwe,
ROM 9:31 ma ndị Izrel na-agbaso iwu nke ezi omume, enwebeghị ike ime onwe ha ndị a ga-anabata.
ROM 9:32 Gịnị gbochiri ha? Ọ bụ nʼihi na ha agbasoghị ya site nʼokwukwe. Kama ha chere na ọ bụ site nʼọrụ. Ha zọhiere ụkwụ nʼoke nkume ịsọ ngọngọ ahụ.
ROM 9:33 Dịka e dere ya, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa. Ma onye nke kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
ROM 10:1 Ụmụnna m, ihe na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwu na ekpere m na-ekpe nye Chineke bụ ịhụ na a zọpụtara ha.
ROM 10:2 Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nʼobi nke ukwuu. Kama ịnụ ọkụ nʼobi ha abụghị site na mmazu Chineke.
ROM 10:3 Ebe ha na-amaghị ezi omume nke si na Chineke bịa kama ha chọrọ ihiwe nke onwe ha, ha ewedaghị onwe ha nʼokpuru ezi omume nke Chineke.
ROM 10:4 Kraịst bụ ọgwụgwụ iwu. Ya mere, ezi omume ga-adịrị onye ọbụla nke kwere.
ROM 10:5 Mosis si otu a dee banyere ezi omume nke sitere nʼiwu, “Onye ọbụla na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ site na ha.”
ROM 10:6 Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, “Asịla nʼime obi gị, ‘onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’ ” (nke bụ, ikudata Kraịst)
ROM 10:7 “maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’ ” (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ).
ROM 10:8 Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,” ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa.
ROM 10:9 Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị.
ROM 10:10 Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị.
ROM 10:11 Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
ROM 10:12 Nʼihi na o nweghị ihe dị iche nʼetiti onye Juu na onye mba ọzọ, otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onye nwe mmadụ niile, ọ na-agọzibigakwa ndị na-akpọku ya oke.
ROM 10:13 Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.”
ROM 10:14 Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị?
ROM 10:15 Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.”
ROM 10:16 Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?”
ROM 10:17 Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst.
ROM 10:18 Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie. “Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.”
ROM 10:19 Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị, “Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu; aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.”
ROM 10:20 Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị, “Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m, ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.”
ROM 10:21 O kwuru banyere ndị Izrel, “Agbasara m aka m ogologo ụbọchị niile nye ndị nnupu isi na ndị na-ekwesị olu ike.”
ROM 11:1 Mgbe ahụ a na m ajụ, ọ ga-abụ na Chineke ajụla ndị ya? Mba, nke a apụghị ime, nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye Izrel. Abụ m nwa nwa Ebraham, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta.
ROM 11:2 Chineke ajụbeghị ndị ya bụ ndị ọ họpụtara site na mmalite ihe niile. Ọ bụ na unu amaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu banyere Ịlaịja, otu o siri rịọ Chineke arịrịọ megide ụmụ Izrel?
ROM 11:3 “Onyenwe m, ha egbuchala ndị amụma gị niile, mebisiekwa ebe ịchụ aja gị niile, maọbụ naanị m fọdụrụ. Ha na-achọkwa ụzọ igbu m.”
ROM 11:4 Gịnị bụ ọsịsa Chineke nyere ya? “E nwere m puku mmadụ asaa ọzọ ndị hụrụ m nʼanya, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal.”
ROM 11:5 Otu a ka ọ dịkwa nʼoge dị ugbu a, a họrọla mmadụ ole na ole site nʼamara ya.
ROM 11:6 Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu.
ROM 11:7 Gịnịkwa? Ihe ndị Izrel jiri ike ha niile na-achọ nke ha na-achọtaghị ka ndị a họpụtara chọtara. Ndị nke ọzọ mechiri obi ha.
ROM 11:8 Dịka e dere ya, “Chineke nyere ha mmụọ na-eme mmadụ iberiibe. O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ, nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe; o mere nke a ruo taa.”
ROM 11:9 Devid kwukwara, “Ka tebul ha ghọọrọ ha igbudu na ọnya, ha bụrụkwa ihe ịsọ ngọngọ na ntaramahụhụ nye ha.
ROM 11:10 Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ. Mee ka azụ ha bụrụ ihe arọjiri arọji ruo mgbe ebighị ebi.”
ROM 11:11 Ajụjụ ọzọ m na-ajụ bụ nke a: Ọ ga-abụ na ha sụrụ ngọngọ ka ha daa ma ghara ibilite ọzọ? Ọ bụghị otu a! Kama nʼihi mmehie ha, nzọpụta rutere ndị mba ọzọ ka e sitekwa na nke a kpalie ekworo nʼime ụmụ Izrel.
ROM 11:12 Ma ọ bụrụ na mmehie ha wetara akụnụba nye ụwa, ọ bụrụkwa na ịbụ ogbenye ha wetara ngọzị nye ndị mba ọzọ, ọ bụ na ngọzị babigara ụba oke agaghị adị mgbe a ga-agụkọta ọnụọgụgụ ha niile?
ROM 11:13 Ugbu a, unu ndị mba ọzọ, ka m na-agwa okwu. Ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ onyeozi nye ndị mba ọzọ, ana m enwe afọ ojuju nʼihi ije ozi m.
ROM 11:14 Nʼihi na enwere m olileanya na, ma eleghị anya, apụrụ m isite nʼụzọ a kpasuo ekworo nʼime ụfọdụ ụmụnna m, ka e site nʼekworo ha zọpụta ụfọdụ nʼime ha.
ROM 11:15 Ọ bụrụ na ọ bụ site nʼọjụjụ a jụrụ ha ka e siri mee ka ụwa dịrị na mma, gịnị ga-eme mgbe a nabatara ha? Ọ ga-adị ka i si nʼọnwụ bilie ọzọ, nwee ndụ ọzọ.
ROM 11:16 Ebe ọ bụkwa na iberibe achịcha e jiri chụọ aja bụ ihe dị nsọ, mgbe ahụ, achịcha ahụ niile bụ ihe dị nsọ. Nʼihi na ọ bụrụ na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ, otu a kwa, alaka ya ga-adịkwa nsọ.
ROM 11:17 Ma a nyakapụrụ ụfọdụ alaka osisi a, werekwa unu bụ alaka osisi oliv ọhịa nyapagide nʼọnọdụ ha. Ya mere, unu esorola keta oke na ngọzị sitere na mgbọrọgwụ osisi oliv ahụ.
ROM 11:18 Ma unu ekwesighị ịnya isi na a dọkapụrụ alaka ndị ọzọ were unu dochie nʼọnọdụ ha. Ihe unu na-aghaghị ịmata bụ nke a: unu bụ naanị alaka dị nʼosisi. Ọ bụghị unu na-ebu mgbọrọgwụ osisi, kama ọ bụ mgbọrọgwụ osisi na-ebu unu.
ROM 11:19 Ma eleghị anya unu nwere ike kwuo, “Ma a nyakapụrụ alaka ụfọdụ e nwee ohere ebe a ga-anyapagide anyị.”
ROM 11:20 Nke ahụ bụ eziokwu. Ma chetakwanụ na a nyakapụrụ ha nʼihi ekweghị ekwe ha, ma unu nọ naanị site nʼokwukwe. Ya mere anyala isi, kama na-atụ egwu.
ROM 11:21 Nʼihi na ọ bụrụ na Chineke emereghị alaka nke osisi ahụ wapụtara nʼonwe ya ebere, ọ gaghị emekwara gị ebere.
ROM 11:22 Ya mere, tulee obiọma na aka ike Chineke, aka ike nʼebe ndị dara ada nọ, ma obiọma nʼebe unu nọ, naanị mgbe unu na-anọgideghị nʼobi ebere ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-anyakapụkwa unu.
ROM 11:23 Ma ọ bụrụ na ha anọgideghị na-ekweghị ekwe, a ga-anyapagidekwa ha nʼihi na Chineke pụrụ ịnyapagide ha ọzọ.
ROM 11:24 Nʼihi na asị na e gbupụtara unu site nʼalaka osisi oliv ọhịa, nyapagide unu nʼosisi oliv ọma ahụ nʼụzọ na-abụghị usoro ndụ, gịnị kwanụ ga-egbochi ịnabata alaka ndị ya, bụ ndị si na ya, mee ka ha laghachi azụ nʼosisi oliv ahụ e si nyakapụ ha.
ROM 11:25 Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe omimi a, ka unu ghara ịnya isi. Nnupu isi ụfọdụ ụmụ Izrel agaghị adịgide kama ọ ga-adị ruo nʼoge ọnụọgụgụ ndị mba ọzọ a ga-anabata zuru.
ROM 11:26 Mgbe ahụ, a ga-azọpụta Izrel niile. Dịka e dere ya, “Onye nzọpụta ga-esite na Zayọn bịa. Ọ ga-eme ka Jekọb site na ndụ asọpụrụghị Chineke chigharịa.
ROM 11:27 Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha, mgbe m wepụrụ mmehie ha niile.”
ROM 11:28 Nʼihe banyere oziọma, ha bụ ndị iro nke Chineke nʼihi unu. Ma a bịa nʼihe gbasara nhọpụta, ha bụ ndị nke a hụrụ nʼanya nʼihi ndị nna nna ha.
ROM 11:29 Nʼihi na enye anarakwa adịghị nʼonyinye nakwa ọkpụkpọ Chineke.
ROM 11:30 Unu onwe unu ndị na-enupuru Chineke isi na mbụ, anatala ebere ya ugbu a, nʼihi nnupu isi ha.
ROM 11:31 Otu a ka ọ dịkwa, ha bụ ndị na-enupu isi ugbu a ka ha nwe ike soro unu keta oke site nʼebere Chineke meere unu.
ROM 11:32 Nʼihi na Chineke enyefeela onye ọbụla nʼaka nnupu isi, ka o si otu a gosi mmadụ niile obi ebere ya.
ROM 11:33 Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu! Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile, ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta.
ROM 11:34 “Onye maara uche Onyenwe anyị? Ma ọ bụ onye bụ onye ahụ na-enye ya ndụmọdụ?”
ROM 11:35 “Onye burula ụzọ nye Chineke ihe, nke ga-eme ka Chineke kwụghachi ya?”
ROM 11:36 Nʼihi na ihe niile sitere nʼime ya, sitekwa nʼaka ya, dịkwara ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi! Amen.
ROM 12:1 Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.
ROM 12:2 Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.
ROM 12:3 Dịka onyinye amara e nyere m siri dị, ana m adọ onye ọbụla nʼime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nʼechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesi. Kama, jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dịka okwukwe Chineke nyere unu ha.
ROM 12:4 Dịka anyị niile nʼotu nʼotu si nwe anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche,
ROM 12:5 nʼotu aka ahụ, nʼime Kraịst anyị bụ otu, nʼagbanyeghị na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu anụ ahụ. E jikọtara anyị niile nʼotu nʼotu nye ibe anyị.
ROM 12:6 Anyị nwere onyinye dị iche iche nke e sitere nʼamara nye anyị, ọ bụrụ na onye ọbụla nwere onyinye ibu amụma, ya buo ya dịka okwukwe o nwere ha.
ROM 12:7 Ọ bụrụ ije ozi, ya jee ozi, ya bụrụkwanụ izi ihe, ya zie ihe.
ROM 12:8 Ka onye nwere onyinye ịgbaume, gbaa ndị ọzọ ume, ya bụrụkwanụ inyeaka, ka onye nwere onyinye a site nʼafọ ofufu mee ya, ọ bụrụ ịbụ onyendu, ka onye ahụ duo site nʼikpachapụ anya, ya bụrụkwanụ ime ebere, ka onye ahụ jiri obi ụtọ na-eme ya.
ROM 12:9 Ka ịhụnanya bụrụ nke ihu abụọ nʼadịghị na ya, kpọọ ihe ọjọọ asị, jidesie ihe dị mma ike.
ROM 12:10 Hụrịtanụ onwe unu nʼanya, dịka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụkwaranụ ibe unu karịa otu ha si asọpụrụ unu.
ROM 12:11 Unu abụla ndị umengwụ nʼọrụ unu. Kama werenụ mmụọ na obi na-anụ ọkụ na-ejere Onyenwe anyị ozi mgbe niile.
ROM 12:12 Nweenụ obi aṅụrị nʼime olileanya, nweenụ ntachiobi nʼime nsogbu, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile.
ROM 12:13 Na enyetụnụ ụfọdụ ndị nsọ ihe site nʼihe unu nwere iji gboo mkpa dịrị ha. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa anya nke ọma.
ROM 12:14 Gọzienụ ndị na-akpagbu unu, gọzienụ ha, unu abụkwala ha ọnụ.
ROM 12:15 Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soronụ ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nʼiru ụjụ, soronụ ha ruo ụjụ.
ROM 12:16 Na-ebinụ nʼudo. A bụla onye mpako, unu na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe niile.
ROM 12:17 Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị. Kama, na-echenụ otu unu ga-esi mee ihe dị mma nʼanya mmadụ niile.
ROM 12:18 Dịka ike gị niile ha, mee ka gị na onye ọbụla biri nʼudo.
ROM 12:19 Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ka Onyenwe anyị kwuru.
ROM 12:20 Ma otu ọ dị, “ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, were nri zụọ ya, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ihe ọṅụṅụ ka ọ ṅụọ, mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya.”
ROM 12:21 Unu ekwela ka ihe ọjọọ merie unu, kama werenụ ezi ihe merie ihe ọjọọ.
ROM 13:1 Ka onye ọbụla doo onwe ya nʼokpuru ndị na-achị achị, nʼihi na ikike ọchịchị ọbụla agaghị adị ma ọ bụrụ na Chineke akwadoghị ya. Ọ bụkwa Chineke tọrọ ntọala ikike ọchịchị niile e nwere.
ROM 13:2 Ya mere, onye ọbụla na-enupu isi nʼokpuru ọchịchị, na-emegide ihe Chineke hiwere, ndị na-eme nke a ga-ewetara onwe ha ikpe ọmụma.
ROM 13:3 Ndị na-eme ezi ihe anaghị atụ egwu ndị nọ nʼọchịchị, kama ndị na-atụ ha egwu bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ya mere ọ bụrụ na ị chọghị ịtụ ndị na-achị achị egwu, mee ihe dị mma, ha ga-etokwa gị.
ROM 13:4 Nʼihi na ọ bụ onyeozi Chineke maka ọdịmma nke gị, ma ọ bụrụ na unu mere ihe na-adịghị mma, tụọnụ egwu, nʼihi na onye na-achị achị nwere ezi nkwado ịta onye mere ihe ọjọọ ahụhụ. Ọ bụ onyeozi Chineke bụrụkwa onye na-eji ọnụma na-ata ndị mmebi iwu ahụhụ.
ROM 13:5 Ya mere unu kwesiri irubere ndị na-achị achị isi, ọ bụghị naanị maka ahụhụ dịrị ndị nnupu isi, kama nʼihi akọnuche.
ROM 13:6 Ọ bụkwa nke a kpatara unu ji na-atụ ụtụ isi nke taks, nʼihi na ndị na-achị achị na-ejere Chineke ozi mgbe ha na-aga nʼihu nʼezi ọchịchị.
ROM 13:7 Kwụghachinụ onye ọbụla ihe unu ji ha nʼụgwọ, ọ bụrụ na unu ji ụgwọ ụtụ taks, kwụọnụ ya, ọ bụrụkwa ụgwọ ụtụ isi nke akụnụba unu, ka unu ji, kwụọnụ ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla kwesiri ka a sọpụrụ ya, sọpụrụnụ onye dị otu a, ọ bụrụkwa na onye ọbụla kwesiri ka a kwanyere ya ugwu kwanyerenụ ya ugwu.
ROM 13:8 Kwụọnụ ụgwọ niile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nʼanya. Nʼihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nʼanya, ị na-emezu ihe niile iwu chọrọ.
ROM 13:9 Iwu niile e nyere, “Gị akwala iko,” “Egbula mmadụ,” “Ezula ohi,” “Enwela anya ukwu nʼihe mmadụ ibe gị nwere,” nakwa iwu ndị ọzọ niile e nyere ka a chịkọtara nʼotu nke a sịrị: “Hụ mmadụ ibe gị nʼanya dịka onwe gị.”
ROM 13:10 Ịhụnanya adịghị echere onye agbataobi ya echiche ọjọọ, ya mere ịhụnanya bụ idebezu iwu niile.
ROM 13:11 Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya abịala nso. Ya mere, sitenụ nʼụra bilie, nʼihi na nzọpụta anyị adịla nso ugbu a karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ.
ROM 13:12 Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ. Ka anyị yipụ uwe ọrụ nke ọchịchịrị, ma yikwasị ngwa agha nke ìhè.
ROM 13:13 Bụrụnụ ndị dị ọcha, dịka ndị na-akpagharị nʼehihie. Ọ bụghị nʼịgba egwu ruru unyi, maọbụ nʼịṅụbiga mmanya oke, ọ bụghị nʼịkwa iko, na imefe ihe ụwa oke. Ọ bụghị nʼesemokwu, na ekworo.
ROM 13:14 Kama yirinụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịka uwe. Unu enyekwala ahụ unu ohere inweta ihe niile nke na-agụ ya.
ROM 14:1 Nabatanụ ndị okwukwe ha na-esighị ike nʼetiti unu. Ma ọ bụghị nʼihi ise okwu banyere ihe ntule nke obi.
ROM 14:2 Otu onye nwere okwukwe iri ihe niile, ma onye na-adịghị ike nʼokwukwe, na-eri naanị ahịhịa nri.
ROM 14:3 Onye ahụ na-eri ihe niile e kwesighị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ nke nʼadịghị eri ihe niile ekwesighị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nʼihi na Chineke anabatala onye ahụ.
ROM 14:4 Onye ka ị bụ i ji na-ekpe odibo onye ọzọ ikpe? Onye ọ dịrị ikpebi ma odibo ya ọ na-emezi emezi ma ọ dịghị emezi bụ nna ya ukwu. Ma odibo ahụ aghaghị iguzosi ike nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ ime ka o guzosie ike.
ROM 14:5 Otu onye nwere ike na-eche na otu ụbọchị kacha ndị ọzọ na ịdị nsọ, onye nke ọzọ nwekwara ike na-eche na ụbọchị niile bụ otu ihe, ma o kwesiri ka onye ọbụla kpebiere onwe ya.
ROM 14:6 Onye ọbụla na-eche nʼotu ụbọchị bụ nke pụrụ iche, na-eme nke a nye Onyenwe anyị. Onye ọbụla na-eri otu ihe na-eri ya nʼihi Onyenwe anyị. Ma onye na-adịghị eri otu ihe ahụ na-eme kwa nke a nye Onyenwe anyị. Ma na-enyekwa Chineke ekele.
ROM 14:7 Nʼihi na o nweghị onye nʼime anyị na-adịrị naanị onwe ya ndụ, o nwekwaghị onye nʼime anyị na-anwụrụ naanị onwe ya ọnwụ.
ROM 14:8 Ọ bụrụ na anyị adịrị ndụ, anyị dị ndụ nye Onyenwe anyị; ọ bụrụkwa na anyị anwụọ, anyị nwụrụ nye Onyenwe anyị; ya mere ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Onyenwe anyị.
ROM 14:9 Ọ bụ nʼihi nke a ka Kraịst ji nwụọ, ma biliekwa, ka ọ bụrụ Onyenwe nke ndị dị ndụ na nke ndị nwụrụ anwụ.
ROM 14:10 Ma gị onwe gị, gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe? Gịnị mekwara i ji eleda ya anya? Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼotu nʼotu nʼihu oche ikpe Chineke.
ROM 14:11 E dere ya, “ ‘Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,’ ka Onyenwe anyị kwuru, ‘ikpere niile ga-egbu nʼihu m; ire niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ ”
ROM 14:12 E, anyị niile nʼotu nʼotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nʼihu Chineke.
ROM 14:13 Ya mere, ka anyị kwụsị ikperịta onwe anyị ikpe, kama kpebie nʼime obi gị na i gaghị edochiri nwanna gị ihe ga-eme ka ọ sụọ ngọngọ maọbụ ihe mgbochi nʼụzọ.
ROM 14:14 Dịka onye nọ nʼime Onyenwe anyị Jisọs, o doro m anya nke ọma na o nweghị ihe ọbụla na-adịghị ọcha na nke onwe ya. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-ahụta ihe ọbụla dịka ihe na-adịghị ọcha, nye onye dị otu a, ihe ahụ adịghị ọcha.
ROM 14:15 Ọ bụrụkwa na ihe ị na-eri na-ewute nwanna gị, ị naghị egosi na ị hụrụ ya nʼanya. Ekwela ka nri ị na-eri bụrụ ihe ga-ewetara nwanna gị ịla nʼiyi, nʼihi na cheta na ọ bụkwa nʼihi ya ka Kraịst jiri bịa nwụọ.
ROM 14:16 Ekwela ka ihe ọma gị bụrụ nke a ga-akpọ ajọọ ihe.
ROM 14:17 Nʼihi na alaeze Chineke abụghị oriri na ọṅụṅụ kama ọ bụ ezi omume, na udo na ọṅụ nʼime Mmụọ Nsọ.
ROM 14:18 Nʼihi na onye ọbụla na-efe Kraịst nʼụzọ dị otu a, na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, ụmụ mmadụ na-anabatakwa ya.
ROM 14:19 Ka ihe na-agụsị gị agụụ ike bụrụ ime ihe ga-eweta udo, ya na ime ihe nʼụzọ a ga-esi mee ka e wulie ndị ọzọ elu.
ROM 14:20 Emebikwala ọrụ Chineke nʼihi nri; nri niile dị ọcha, ma o kwesighị ka onye ọbụla rie ihe ga-eme ka onye ọzọ sụọ ngọngọ.
ROM 14:21 Ọ ga-akara gị mma ka ị hapụ iri anụ maọbụ ịṅụ mmanya ma ọ bụkwanụ ime ihe ọbụla ga-eme ka nwanna gị sụọ ngọngọ.
ROM 14:22 Ya mere, ka okwukwe i nwere banyere ihe ndị a bụrụ nke dị nʼetiti gị na Chineke. Ngọzị na-adịrị onye ọbụla nke na-adịghị ama onwe ya ikpe site nʼihe ọ nabatara.
ROM 14:23 Ma onye ọbụla na-eri ihe ọbụla site nʼobi abụọ bụ onye ikpe mara, nʼihi na ọ jighị okwukwe rie ya, nʼihi na ihe ọbụla a na-esiteghị nʼokwukwe mee bụ mmehie.
ROM 15:1 Anyị onwe anyị bụ ndị dị ike kwesiri ịnagide mgbe ndị na-adịghị ike mejọrọ anyị, ọ bụghị ime ihe ga-atọ anyị ụtọ.
ROM 15:2 Ka onye ọbụla nʼime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbataobi ya ụtọ maka ọdịmma ha, ka o wulie ha elu.
ROM 15:3 Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya emeghị ihe tọrọ ya ụtọ, kama dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Mkparị niile nke ndị na-akparị gị dakwasịrị m!”
ROM 15:4 Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya.
ROM 15:5 Ka Chineke ahụ na-enye agbamume na ntachiobi nye unu mmụọ nke ịdị nʼotu nʼetiti onwe unu, dịka Kraịst Jisọs nwere.
ROM 15:6 Nʼihi na nke a ga-eme ka unu niile jikọtaa obi unu, na olu unu nʼotu, inye Chineke na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto.
ROM 15:7 Nʼihi ya, nabatanụ onwe unu dị ka Kraịst nabatara unu, iji wetara Chineke otuto.
ROM 15:8 Ma ana m agwa unu na Kraịst aghọọla onye na-ejere ndị e biri ugwu ozi nʼihi eziokwu nke Chineke, iji mee ka nkwa e kwere ndị bụ nna nna anyị ochie guzozie.
ROM 15:9 Ka ndị mba ọzọ nwe ike inye Chineke otuto maka ebere ya, dịka e dere ya, “Nʼihi nke a, aga m eto gị nʼetiti ndị mba ọzọ, aga m abụ abụ nye aha gị.”
ROM 15:10 O kwukwara ọzọ sị, “Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.”
ROM 15:11 Ọzọkwa, “Toonu Onyenwe anyị unu ndị mba ọzọ niile, ka ndị niile dị iche iche jaakwa ya mma.”
ROM 15:12 Ọzọkwa, Aịzaya na-asị, “Mgbọrọgwụ Jesi ga-epulite ọzọ, onye nke ga-ebili ịchị mba niile, ndị mba ọzọ ga-enwekwa olileanya nʼime ya.”
ROM 15:13 Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ.
ROM 15:14 Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe.
ROM 15:15 Ma otu ọ dị, edepụtala m ụfọdụ isi okwu nʼebe o doro anya nye unu, iji chetara unu ha ọzọ, nʼihi amara Chineke nyere m,
ROM 15:16 abụ m onyeozi Kraịst Jisọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ.
ROM 15:17 Nʼihi ya, ana m anya isi nʼime Kraịst Jisọs banyere ọrụ m na-arụrụ Chineke.
ROM 15:18 Agaghị m anwa anwa kwuo okwu banyere ihe ọzọ karịakwa ihe ndị ahụ Kraịst rụpụtara site nʼaka m, bụ idubata ndị mba ọzọ, ime ka ha rube isi nye Chineke, site nʼokwu ọnụ m na ihe m rụrụ,
ROM 15:19 nke pụtara ihe nʼọrụ ebube na ihe ịrịbama site nʼike nke Mmụọ nke Chineke. Ya mere, site na Jerusalem ruo Ilirikom, ekwusaala m nʼụzọ zuru ezu, oziọma Kraịst.
ROM 15:20 Ọchịchọ obi m mgbe niile bụ ikwusa oziọma ahụ nʼebe ọbụla ndị mmadụ na-anụtụbeghị ihe banyere Kraịst, ka m ghara ịbụ onye na-ewukwasị ihe nʼelu ntọala nke onye ọzọ tọrọ,
ROM 15:21 ma dịka e dere ya, “Ndị a na-agwaghị ihe banyere ya ga-ahụ, ndị a ka anụbeghị, ga-aghọtakwa.”
ROM 15:22 Nʼezie, nke a bụ ihe mere m na-ejibeghị nwee ohere ịbịakwute unu.
ROM 15:23 Nʼihi na ọ dịla ọtụtụ afọ kemgbe m bidoro na-enwe mmasị m ga-abịa hụ unu anya, ma ugbu a, ọrụ m nwere nʼakụkụ a agwụla, oge eruola mgbe m ji ahapụ ebe a.
ROM 15:24 Nʼihi na nzube m bụ ijeru obodo Spen. Mgbe ọbụla m ga-agakwa, aga m akwụsị ịhụ unu na elekwa anya na unu ga-edupụ m nʼije m, mgbe mụ na unu jiri ọṅụ nọrọtụ nwa mgbe nta.
ROM 15:25 Ma ugbu a, ana m aga Jerusalem ebe m na-ejere ndị nsọ ozi.
ROM 15:26 Nʼihi na ọ dị ndị Masidonia na Akaịa ezi mma iwere nʼụfọdụ nʼihe ha nwere nyere ndị ogbenye nọ nʼetiti ndị nsọ nọ na Jerusalem aka.
ROM 15:27 Ha ji ọṅụ mee nke a, nʼezie ha ji ha ụgwọ i mere ha otu a. Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ so ha keta oke na ngọzị nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nʼakụnụba ha nwere kenye ha.
ROM 15:28 Ya mere, mgbe m mezuru nke a, hụkwa na ha anatala onyinye ahụ a tụkọtara ha, aga m abata ịhụ unu mgbe m na-aga Spen.
ROM 15:29 Amaara m na mgbe m ga-abịakwute unu, aga m abịa nʼime ozuzu oke ngọzị nke Kraịst.
ROM 15:30 Esi m nʼaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya anyị nwere nʼime Mmụọ Nsọ na-arịọ unu, ụmụnna m, ka unu soro m na-ekpe ekpere, na-echetanụ m nʼekpere unu nʼihu Chineke.
ROM 15:31 Ka a dọpụta m nʼaka ndị na-ekweghị ekwe nọ na Judịa. Ka ọrụ m maka Jerusalem bụrụ ihe ndị nsọ nọ ebe ahụ ga-anabata.
ROM 15:32 Ka ọ ga-abụ site nʼuche Chineke, aga m abịakwute unu nʼọṅụ kurukwa ume ndụ na nnọkọ mụ na unu.
ROM 15:33 Ka Chineke ahụ na-enye udo, nọnyere unu niile. Amen.
ROM 16:1 Ana m eme ka unu mata nwanna anyị nwanyị, Fibi, onye na-ejere nzukọ ozi na chọọchị dị nʼobodo Senkria.
ROM 16:2 Biko nabatanụ ya nʼime Onyenwe anyị dịka o kwesiri ndị ya. Nyekwaranụ ya aka nʼụzọ niile unu nwere ike, nʼihi na o nyerela mụ na ọtụtụ ndị ọzọ aka.
ROM 16:3 Keleerenụ m Prisila na Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ Kraịst Jisọs.
ROM 16:4 Ndị a atụghị egwu ọnwụ nʼihi ndụ m. Ọ bụghị naanị mụ onwe m na ekele ha, kama nzukọ Kraịst ndị dị na mba ọzọ niile na-ekelekwa ha.
ROM 16:5 Biko kelekwaaranụ m ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ha. Keleerenụ m ezi enyi m Epinetus. Nwoke a bụ onye buru ụzọ nabata Kraịst nʼobi ya, nʼakụkụ Eshịa niile.
ROM 16:6 Keleerenụ m Meri, onye rụsịrị ọrụ ike nʼetiti unu.
ROM 16:7 Ana m ekelekwa Andronaikọs na Juniya, ndị ikwu m, ndị e tinyekọtara mụ na ha nʼụlọ mkpọrọ. Ndị ozi niile na-asọpụrụ ha. Ha bukwa m ụzọ kwere na Kraịst.
ROM 16:8 Kelekwaaranụ m Ampliatọs onye m hụrụ nʼanya nʼime Onyenwe anyị.
ROM 16:9 Keleenụ Ọbanọs, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ Kraịst, na Stakis ezi enyi m.
ROM 16:10 Otu a kwa, keleenụ Apelis onye anwapụtarala nguzosike ya nʼime Kraịst. Keleenụ ndị ezinaụlọ Aristobulọs.
ROM 16:11 Keleerenụ m Herodian onye ikwu m. Keleekwanụ ndị bi nʼụlọ Nasisọs. Ha bụ ndị nke Chineke.
ROM 16:12 Keleekwanụ Traịfina na Traịfosa ndị a na-arụsị ọrụ Onyenwe anyị ike. Keleekwanụ Pesis, onye m hụrụ nʼanya na onye na-arụsị ọrụ Onyenwe anyị ike.
ROM 16:13 Keleere m Rufọs onye Onyenwe anyị nʼonwe ya họpụtara, na nne ya, onye na-emekwara m ka nne.
ROM 16:14 Ana m ekele unu Asinkritọs, Flegọn, Hamis, Patrobas, Hamis na ụmụnna anyị niile ndị ha na ha nọ.
ROM 16:15 Keleerenụ m Filologọs, Juliya, Nerus na nwanne ya nwanyị. Keleekwanụ Olimpas na ndị nsọ niile ha na ha nọ.
ROM 16:16 Werenụ isurita ọnụ dị nsọ, kelerịta onwe unu. Nzukọ Kraịst niile nọ nʼebe a na-ekelekwa unu.
ROM 16:17 Ugbu a, ụmụnna m, ana m arịọ ka unu wezuganụ onwe unu site nʼebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, na-etinye ihe mgbochi nʼụzọ unu, na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nʼihi ozizi ha na-ezi nke megidere ihe ahụ niile e ziri unu.
ROM 16:18 Ndị dị otu a abụghị ndị ozi nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ha na-arụ naanị nʼihi akpa ha. Ha maara otu e si eji ire ụtọ edufu ndị obi ha na-esighị ike.
ROM 16:19 Mmadụ niile anụla maka nrube isi unu na-erubere oziọma ahụ. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi unu. Achọrọ m ka unu bụrụ ndị maara ihe banyere ezi ihe, ka unu bụrụ ndị na-amaghị ihe nʼihe banyere ihe ọjọọ.
ROM 16:20 Mgbe na-adịghị anya, Chineke nke udo ga-azọpịa ekwensu nʼokpuru ụkwụ unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu.
ROM 16:21 Timoti onye so m na-arụkọ ọrụ, na Lusiọs, na Jesin na Sosipata, ndị ikwu m na-ekele unu.
ROM 16:22 Mụ onwe m bụ Tatiọs, onye dere akwụkwọ a, na-ekelekwa unu nʼaha Onyenwe anyị.
ROM 16:23 Gaiọs, onye na-ele mụ na nzukọ niile ọbịa nʼebe a, na-ekelekwa unu. Otu a kwa, ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ya na-ekelekwa unu. Erastọs, onye na-elekọta ihe ndị obodo a na nwanna anyị nwoke Kwatọs, na-ekelekwa unu.
ROM 16:24 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyeere unu niile. Amen.
ROM 16:25 Ana m enyefe unu nʼaka onye ahụ pụrụ ime ka unu guzosie ike site nʼoziọma m kwusaara unu, nakwa nkwupụta nke Jisọs Kraịst, dịka mkpughe nke ihe omimi ahụ e zoro ezo kemgbe ọtụtụ ọgbọ ndị gara aga siri dị.
ROM 16:26 Ma ugbu a, e kpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè site nʼihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ, ka ndị mba ọzọ niile maara ya dịka ihe Chineke ebighị ebi nyere nʼiwu ya si dị, ka ha mụta irube isi nke na-esite nʼokwukwe.
ROM 16:27 Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye naanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst. Amen.
1CO 1:1 Pọl, onye a kpọrọ ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst site nʼọchịchọ Chineke, na nwanna anyị nwoke Sostenis,
1CO 1:2 Ọ bụ unu nzukọ Chineke dị na Kọrint ka a na-edere akwụkwọ a, ndị e doro nsọ nʼime Kraịst Jisọs, na ndị a kpọrọ ibi ndụ dị nsọ, tinyere ndị ahụ niile na-akpọku aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye bụ Onyenwe ha na Onyenwe anyị:
1CO 1:3 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
1CO 1:4 Ana m ekele Chineke ekele nʼihi onyinye amara niile o nyere unu site na Kraịst Jisọs.
1CO 1:5 Nʼihi na e emeela ka unu baa ụba nʼụzọ niile, nʼime ya, ma nʼokwu unu ma na nghọta unu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu niile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwupụta okwu banyere oziọma ya.
1CO 1:6 Nʼihi na ịgba akaebe banyere Kraịst pụtara ihe, guzosiekwa ike na ndụ unu.
1CO 1:7 Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụ unu nke unu na-enweghị, ka unu nọrọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
1CO 1:8 Ọ ga-eme ka unu dị ike ruo na mgbe ikpeazụ, meekwa ka unu bụrụ ndị na-enweghị ịta ụta nʼụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
1CO 1:9 Chineke, onye kpọbatara unu ka unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enwe mmekọrịta kwesiri ntụkwasị obi.
1CO 1:10 Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu niile na-ekwekọrịta nʼihe ọbụla unu kwuru, ka nkewa ọbụla gharakwa ịbata nʼetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nʼotu, nʼechiche obi unu na nʼizu unu.
1CO 1:11 Nʼihi na ụmụnna m, esi m nʼọnụ ndị si nʼezinaụlọ Kloyi bịara nʼebe a nụta na esemokwu dị nʼetiti unu.
1CO 1:12 Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nʼetiti unu. Na ụfọdụ nʼime unu na-asị, “Abụ m onye na-eso Pọl”; ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”; ndị ọzọkwa na-asị, “Ana m eso Sefas”; ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso.”
1CO 1:13 Kraịst, ọ dị abụọ? Ọ bụ Pọl ka a kpọgidere nʼobe nʼihi unu? Ọ dị onye e mere baptizim nʼaha Pọl?
1CO 1:14 Ana m ekele Chineke ekele na ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu m mere baptizim, ewezugakwa Krispọs na Gaiọs.
1CO 1:15 Ya mere, ọ dịghị onye nʼime unu ga-asị na e mere ya baptizim nʼaha m.
1CO 1:16 (Ahaa! Emekwara m Stefanas na ezinaụlọ ya baptizim. Ewezuga ndị a, amaghị m ma m ga-echetakwa onye ọzọ m mere baptizim nʼonwe m.)
1CO 1:17 Nʼihi na Kraịst ezighị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa oziọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta na amamihe nke mmadụ ka ike nke obe Kraịst ghara ịbụ ihe efu.
1CO 1:18 Nʼihi na okwu maka obe bụ ihe nzuzu nye ndị na-efu efu, ma nye anyị ndị a na-azọpụta, ọ bụrụ anyị ike nke Chineke.
1CO 1:19 E dere ya, “Aga m emebi amamihe ndị maara ihe. Aga m emekwa ka oke nghọta nke ndị maara ihe bụrụ ihe efu.”
1CO 1:20 Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu?
1CO 1:21 Ma ebe ọ bụ site nʼamamihe nke Chineke, ụwa enweghị ike ịmata Chineke site na amamihe nke ya, ọ dị Chineke ezi mma isite nʼoziọma nke a na-ekwusa nke ndị mmadụ na-akpọ ihe nzuzu zọpụta ndị kweere.
1CO 1:22 Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe.
1CO 1:23 Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, onye a kpọgburu nʼobe, onye bụ ihe mgbochi nʼebe ndị Juu nọ, ma na ntị ndị mba ọzọ, ọ dị ka okwu nzuzu.
1CO 1:24 Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Griik, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke.
1CO 1:25 Nʼihi na nzuzu Chineke dị mma karịa amamihe niile nke mmadụ, adịghị ike Chineke dịkwa ukwuu karịa ike niile nke mmadụ.
1CO 1:26 Ụmụnna m, chetakwanụ ihe unu bụ mgbe a kpọrọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nʼime unu bụ ndị maara ihe nʼusoro ogugo mmadụ, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nʼobodo.
1CO 1:27 Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dịka ihe nzuzu, ka Chineke họrọ iji mee ka ihere mee ndị amamihe. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dịka ihe na-adịghị ike ka Chineke họọrọ iji mee ka ihere mee ndị dị ike.
1CO 1:28 Nʼihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru.
1CO 1:29 Ka mmadụ ọbụla ghara ịnya isi nʼebe Chineke nọ.
1CO 1:30 Ma ọ bụ nʼihi ya ka unu ji nọrọ nʼime Kraịst Jisọs, onye ghọrọ isi amamihe nye anyị site na Chineke, nke bụ ezi omume anyị na nke ido anyị nsọ, na onye mgbapụta anyị.
1CO 1:31 Ya mere, dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime Onyenwe anyị.”
1CO 2:1 Ụmụnna m, mgbe m bịakwutere unu na mbụ, ejighị m mmụta m na oke okwu megharịa unu anya banyere ihe omimi niile nke okwu Chineke.
1CO 2:2 Nʼihi na ekpebiri m na naanị ihe m ga-ama nʼetiti unu bụ naanị ihe banyere Jisọs Kraịst na mkpọgbu a kpọgburu ya nʼelu obe.
1CO 2:3 Abịakwutere m unu nʼọnọdụ adịghị ike, oke ụjọ na ahụ ịma jijiji.
1CO 2:4 Okwu m na ihe m kwusara abịakwaghị dịka okwu ire ụtọ na nke oke mmụta, ime ka ndị mmadụ kwere, kama ha bịara nʼụzọ igosi ọrụ nke Mmụọ Nsọ na ike ya.
1CO 2:5 Ka okwukwe unu ghara ịdabere nʼamamihe mmadụ, kama ka ọ dabere nʼike Chineke.
1CO 2:6 Ma otu ọ dị, anyị na-ekwu okwu amamihe nʼebe ndị tozuru oke nọ. Ma ọ bụghị amamihe nke oge a, maọbụ nke ndị na-achị ụwa taa, bụ ndị na-aghaghị ịla nʼiyi.
1CO 2:7 Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke nʼụzọ dị omimi, bụ amamihe Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya nʼoge a maka iwetara anyị otuto.
1CO 2:8 O nweghị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị nke ọgbọ a ghọtara ihe banyere nzube a. Nʼihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nʼobe.
1CO 2:9 Ma dịka e dere ya, “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya.”
1CO 2:10 Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya. Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi.
1CO 2:11 Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke.
1CO 2:12 Ma mmụọ nke anyị natara abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị nwee ike ịghọta onyinye amara niile Chineke nyere anyị.
1CO 2:13 Nke a bụ ihe anyị na-ekwu, ọ bụghị nʼokwu a kuziiri anyị site nʼamamihe mmadụ, kama site nʼokwu nke Mmụọ kuziri anyị; anyị ji okwu nke Mmụọ na-akọwa eziokwu nke mmụọ.
1CO 2:14 Ma mmadụ ahụ Mmụọ na-adịghị nʼime ya adịghị anabata ihe ndị ahụ sị na Mmụọ nke Chineke bịa, nʼihi na ha bụ nzuzu nʼebe onye ahụ nọ. Ọ naghị aghọta ha, nʼihi na ha bụ ihe a na-aghọta naanị site nʼike nke Mmụọ.
1CO 2:15 Onye ahụ Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ ya, nwere ike ịghọta ihe ọbụla ma ya onwe ya bụ onye mmadụ ọbụla na-enweghị ike ịghọta.
1CO 2:16 Nʼihi na, “Onye maara uche Onyenwe anyị ruo na ọ ga-ezi ya ụzọ?” Ma anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst.
1CO 3:1 Ụmụnna m, o siiri m ike ịgwa unu okwu dịka a ga-asị na unu bụ ndị tozuru etozu nʼime Mmụọ, kama agwara m unu okwu dịka ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị bụ ụmụntakịrị nʼime Kraịst.
1CO 3:2 Ejighị m nri siri ike na-azụ unu, kama eji m mmiri ara na-azụ unu, nʼihi na unu apụghị iri nri dị ike. Nʼezie, ọ bụladị ugbu a, unu erubeghị iri nri siri ike.
1CO 3:3 Nʼihi na unu na-adị ndụ dịka ndị bi nʼụwa, ebe ọ bụ na ekworo na esemokwu na-adị nʼetiti unu, nke a o zipụtaghị na unu na-eme dịka ndị ụwa, dịka ndị mmadụ efu nọ nʼụwa.
1CO 3:4 Nʼihi na mgbe otu onye na-asị, “Abụ m nke Pọl,” onye ọzọ na-asịkwa, “Abụ m nke Apọlọs,” o gosighị na unu na-akpa agwa dịka ndị bi nʼụwa?
1CO 3:5 Onye bụ Apọlọs? Onye bụ Pọl? Ọ bụ na anyị abụghị ndị na-eje ozi, ndị wetaara unu oziọma unu kweere nʼime ya. Ọrụ dị iche iche anyị rụrụ bụkwa nke anyị rụrụ dịka Onyenwe anyị si kenye anyị ọrụ ahụ.
1CO 3:6 Ọ bụ m kụrụ mkpụrụ ahụ, Apọlọs bụkwa onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri, maọbụ Chineke mere ka o too.
1CO 3:7 Onye kụrụ mkpụrụ ahụ na onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri adịghị mkpa. Ọ bụ Chineke onye mere ka ha too dị mkpa.
1CO 3:8 O nweghị ihe dị iche nʼetiti mụ bụ onye kụrụ mkpụrụ ahụ na Apọlọs onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri. Ọ bụ otu ihe ahụ ka anyị bu nʼobi. Onye ọbụla ga-anata ụgwọ ọrụ ya.
1CO 3:9 Anyị so Chineke na-arụ ọrụ. Unu onwe unu bụkwanụ ubi Chineke bụrụkwa ụlọ ya a na-ewuli elu.
1CO 3:10 Eji m onyinye amara Chineke nyere m tọọ ntọala ọrụ a, dịka ezi onye ọka nʼiwu ụlọ, onye ọzọ amalitela iwukwasị ụlọ nʼelu ntọala ahụ. Ma ka onye ọbụla kpachapụ anya otu o si ewu.
1CO 3:11 O nweghị onye ọzọ pụrụ ịtọ ntọala karịrị ntọala ahụ e bururị ụzọ tọọ. Jisọs Kraịst bụkwa ntọala ahụ.
1CO 3:12 Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla na-eji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, ma ọ bụkwanụ nkume dị oke ọnụahịa, osisi maọbụ okporo ọka, ma ọ bụkwanụ ahịhịa na-ewukwasị nʼelu ntọala ahụ,
1CO 3:13 ọrụ onye ọbụla ga-egosipụta ihe ọ bụ, nʼihi na Ụbọchị ahụ ga-eme ka ọ pụta ìhè. A ga-eji ọkụ kpughee ya nʼihi na ọ bụ ọkụ ka a ga-eji nwapụta ụdị ọrụ ọ bụ mmadụ ọbụla rụrụ.
1CO 3:14 Ọ bụrụ na ọkụ eruchapụghị ihe ọbụla mmadụ ji wuo ụlọ ya nʼelu ntọala ahụ, onye ahụ ga-anata ụgwọ ọrụ.
1CO 3:15 Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọbụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nʼiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma ọ ga-adị ka a ga-asị na e si nʼụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya.
1CO 3:16 Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọnsọ na Mmụọ Nsọ Chineke bi nʼime unu?
1CO 3:17 Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. Nʼihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ.
1CO 3:18 Ka onye o bụla ghara ịghọgbu onwe ya, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu na-eche nʼobi ya na ya bụ onye maara ihe, dịka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ime onwe ya onye nzuzu, ka o nwe ike bụrụ onye maara ihe.
1CO 3:19 Nʼihi na ihe ahụ ụwa na-eche na ọ bụ ezi ịma ihe bụ nzuzu nʼanya Chineke. Nʼihi na e dere ya, “Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile.”
1CO 3:20 Ọzọkwa, “Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ, mara na amamihe ya bụ ihe efu.”
1CO 3:21 Nʼihi nke a, ka onye ọbụla ghara ịnya isi banyere mmadụ. Ihe niile bụ nke gị.
1CO 3:22 Ma ọ bụ Pọl, maọbụ Apọlọs, maọbụ Sefas, maọbụ ụwa a, maọbụ ndụ, maọbụ ọnwụ, maọbụ ihe dị taa na ihe niile ga-adị nʼoge dị nʼihu, ha bụ nke unu.
1CO 3:23 Unu bụkwa nke Kraịst, Kraịst bụkwa nke Chineke.
1CO 4:1 Achọrọ m ka unu na-ele anyị anya dịka ndị na-ejere Kraịst ozi, ndị e nyefere ihe omimi Chineke nʼaka.
1CO 4:2 Ma ihe dị mkpa bụ na o kwesiri ka ndị na-elekọta ihe ọbụla bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi.
1CO 4:3 Anaghị m echegbu onwe m banyere ihe unu na-eche gbasara m maọbụ ihe a na-ekpe nʼụlọikpe nke mmadụ. Nʼezie, anaghị m ekpekwa onwe m ikpe.
1CO 4:4 O doro m anya na akọnuche m adịghị ama m ikpe, ma nke a egosighị na m bụ onye ikpe na-amaghị. Ọ bụ Onyenwe anyị naanị ka ọ dịrị ikpe m ikpe.
1CO 4:5 Ya mere, unu ekpela ikpe tupu oge ya eruo, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abịa. Ọ ga-eme ka ihe niile zoro ezo nʼọchịchịrị pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo niile nke dị nʼobi nʼanwụ. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼotu nʼotu ga-anatakwa otuto ruuru ya site nʼaka Chineke.
1CO 4:6 Ugbu a ụmụnna m ejiri m onwe m na Apọlọs mara unu atụ maka ọdịmma nke unu, ka unu nwee ike isite nʼaka anyị mụta ihe site nʼihe ahụ e dere bụ nke na-asị, “Unu agafekwala ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.” Ka onye ọbụla nʼime unu hapụ iji otu onye nyaa isi ma leda ndị ọzọ anya.
1CO 4:7 Onye gwara gị na ị pụrụ iche nʼetiti mmadụ ndị ọzọ? Ọ dị ihe ọbụla i nwere nke abụghị ihe ị natara anata? Ọ bụ gịnị ka i nwere nke ị na-anataghị anata? Ma ọ bụrụ na i natara ya, gịnị mere i ji anya isi dịka a ga-asị na ị nataghị ya anata?
1CO 4:8 Ma ugbu a, ihe niile zuru unu oke. Ugbu a, unu abụrụkwala ndị ọgaranya. Unu abụrụla eze ma anyị esoghị unu. Nʼezie, ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu anọrọla nʼocheeze unu, ka anyị nwe ike soro unu bụrụ eze.
1CO 4:9 Ọ na-adị m nnọọ ka Chineke o weere anyị bụ ndị ozi mee anyị ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta naanị mgbe ihe niile na-agwụsị agwụsị, dịka ndị a mara ikpe ọnwụ. Nʼihi na-akpọpụtara anyị nʼihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi.
1CO 4:10 Anyị aghọọla ndị nzuzu nʼihi Kraịst, ma unu onwe unu bụ ndị maara ihe nʼime Kraịst. Anyị bụ ndị na-adịghị ike ma unu dị ike. Anyị bụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-eleda anya, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ.
1CO 4:11 Tutu ruo ugbu a, anyị na-ebu ọnụ nọrọkwa nʼakpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị.
1CO 4:12 Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-agọzi ha. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi.
1CO 4:13 Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa.
1CO 4:14 Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dịka ụmụ m hụrụ nʼanya.
1CO 4:15 Ọ bụ ezie na unu nwere ọtụtụ ndị nche, ma unu enweghị karịa otu nna. Nʼihi na ọ bụ m bụ nna unu nʼime Kraịst Jisọs, site nʼoziọma ahụ m wetaara unu.
1CO 4:16 Ya mere, ana arịọ m unu, ka unu na-eṅomi ndụ m.
1CO 4:17 Nʼihi nke a, ana m ezitere unu Timoti, bụ ezi nwa m onye m hụrụ nʼanya, nke kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị. Ọ ga-echetara unu otu m si e bi ndụ nʼime Onyenwe anyị Kraịst Jisọs, dịka m na-akụzi ya nʼebe niile na nzukọ niile.
1CO 4:18 Ụfọdụ nʼime unu amalitela ịfụlị onwe ha elu, chee na mụ enweghị ike ịbịakwute unu ọzọ.
1CO 4:19 Ma site nʼike Onyenwe anyị, aga m abịa ịhụ unu anya nʼoge na-adịghị anya. Mgbe m bịara, aga m achọpụta ihe ndị ahụ na-akpa nganga pụrụ ime, ọ bụghị ihe ha nwere ike ikwu.
1CO 4:20 Nʼihi na alaeze Chineke abụghị ihe okwu ọnụ kama ọ bụ ngosipụta ịdị ike.
1CO 4:21 Ya mere, unu ka ọ dịrị ịhọrọ nke unu chọrọ. Unu chọrọ ka m jiri ụtarị bịakwute unu, ka ọ bụ ka m jiri obi dị umeala na mmụọ nke ịhụnanya bịa?
1CO 5:1 Ọ bụ akụkọ doro anya na-enwe ịkwa iko nʼetiti unu, ụdị nke ndị na-ekweghị ekwe na-apụghị ime, ka unu na-eme. Otu onye nʼime ụlọ unu kpọọrọ nwunye nna ya, ha abụọ e biri.
1CO 5:2 Ma unu na-akpa nganga? Ihe unu kwesiri ime ọ bụghị ịkwa akwa na iru ụjụ, na ime ka onye mere ihe dị otu a si nʼọgbakọ unu pụọ?
1CO 5:3 Ọ bụ ezie na mụ na unu anọghị ugbu a, ma mụ na unu nọkwa nʼime mmụọ. Amaala m rịị onye ahụ ikpe dịka a ga-asị na mụ na unu nọ.
1CO 5:4 Eji m aha Onyenwe anyị ma ya ikpe. Mgbe unu zukọrọ, aga m anọnyere unu na mmụọ. Nʼoge ahụ, site nʼike Onyenwe anyị Jisọs,
1CO 5:5 werenụ nwoke a nyefee nʼaka ekwensu, ka ọ taa anụ ahụ ya ahụhụ, ka e nwee ike ịzọpụta mmụọ ya, mgbe Onyenwe anyị lọghachiri.
1CO 5:6 Ịnya isi unu ezighị ezi. Ọ bụ unu amaghị na nwantakịrị yiist a gwakọrọ nʼụtụ ọka na-eme ka o koo?
1CO 5:7 Wepụnụ ihe nʼeko achịcha a nọ nʼetiti unu, ka unu bụrụ ndị dị ọhụrụ, na ndị dị ọcha. Nʼihi na a chụọlarị Kraịst, bụ aja nwa atụrụ, nke Ngabiga anyị.
1CO 5:8 Nʼihi ya ka anyị mee mmemme a na-ejighị ihe na-eko achịcha nke bụ ihe ọjọọ na obi ọjọọ, kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko nke bụ obi ọcha na eziokwu.
1CO 5:9 E dere m unu nʼime akwụkwọ ozi m, ka unu na ndị na-akwa iko ghara inwe mmekọ ọbụla.
1CO 5:10 Ọ bụghị ihe gbasara ndị nke ụwa ndị na-akwa iko, maọbụ ndị anya ukwu, na ndị na-apụnara mmadụ ihe, maọbụ ndị na-ekpere arụsị. Ọ bụrụ otu a, ọ pụtara na unu ga-esi nʼụwa pụọ.
1CO 5:11 Ma ugbu a, a na m edere unu ka unu na onye ọbụla nke na-akpọ onwe ya nwanna nwoke maọbụ nwanna nwanyị ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na ọ na-ebi ndụ ịkwa iko, maọbụ nwee anya ukwu, maọbụ na-ekpere arụsị, onye na-ekwutọ ibe ya, onye na-aṅụbiga mmanya oke, maọbụ onye na-apụnara mmadụ ihe. Unu na ndị dị otu a erikọla nri.
1CO 5:12 Kedụ nke gbasara m ikpe ndị na-esoghị na chọọchị ikpe? Ọ bụghị ndị nọ nʼime ka unu ga-ekpe ikpe.
1CO 5:13 Chineke ga-ekpe ndị nọ nʼezi ikpe. “Chụpụnụ onye ajọọ mmadụ ahụ site nʼetiti unu.”
1CO 6:1 Mgbe onye ọbụla nʼetiti unu nwere esemokwu megide ibe ya, unu ọ pụrụ i buru okwu ahụ gaa nʼụlọikpe ka ndị ajọ omume kpeere unu ikpe, karịa ịga ya nʼihu ndị nsọ?
1CO 6:2 Ọ bụ na unu amabeghị na ọ bụ ndị nsọ ga-ekpe ụwa ikpe? Ọ bụrụkwa na unu ga-ekpe ụwa ikpe, ọ pụtara na unu etozughị oke idozi okwu ntakịrị dapụtara nʼetiti unu?
1CO 6:3 Ọ bụ na unu amataghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi okwu ụka dịkarịsịrị nta nke ndụ a?
1CO 6:4 Ya mere, ọ bụrụ na esemokwu dị otu a adapụta nʼetiti unu, unu ga-ewere okwu ahụ jekwuru ndị ibi ndụ ha na-akpọ nzukọ ihe efu ka ha kpee ya?
1CO 6:5 Ana m ekwu nke a ime ka ihere mee unu. Ọ ga-abụ na e nweghị ike ịchọta ọ bụladị otu onye maara ihe nʼetiti unu, onye ga na-ekpe ikpe dị nʼetiti nwanna na ibe ya?
1CO 6:6 Ma lee, nwanna na-akpọrọ nwanna ya aga ụlọ ikpe, ka ndị na-ekweghị ekwe kpee ha ikpe!
1CO 6:7 Ebe unu na-enwe esemokwu nke ikpe ikpe nʼetiti unu, ọ pụtara na unu bụ ndị emeriri kpamkpam. Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka emejọ unu? Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka a ghọgbuo unu?
1CO 6:8 Ma unu onwe unu na-emejọ, ma na-aghọgbu, ọ bụladị ụmụnna unu nʼime Kraịst.
1CO 6:9 Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,
1CO 6:10 ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke.
1CO 6:11 Na mbụ, ụfọdụ nʼime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼime Mmụọ nke Chineke anyị ka a gụrụ unu ka ndị ezi omume.
1CO 6:12 Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m.
1CO 6:13 Unu na-asị, “E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma Chineke ga-emebi ma afọ ma ihe oriri.” Ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka Onyenwe anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị.
1CO 6:14 Chineke mere ka Onyenwe anyị site nʼọnwụ bilie, ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị si nʼọnwụ bilie.
1CO 6:15 Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa!
1CO 6:16 Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”
1CO 6:17 Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ.
1CO 6:18 Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.
1CO 6:19 Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.
1CO 6:20 E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.
1CO 7:1 Ugbu a, okwu banyere ihe unu dere nʼakwụkwọ: “Ọ dị mma ka nwoke ghara ịmetụ nwanyị aka.”
1CO 7:2 Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya.
1CO 7:3 Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ.
1CO 7:4 Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya.
1CO 7:5 Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.
1CO 7:6 Anaghị m enye nke a dị ka iwu, kama ọ bụ alo ka m na-atụnyere unu.
1CO 7:7 Asị m kwuo, aga m asị na ọ ga-aka mma ka mmadụ niile nọrọ dị ka m. Ma onye ọbụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya. O nyere otu onye nke a, onye ọzọ nke ọzọ.
1CO 7:8 Ma ana m agwa ndị na-anọghị nʼọnọdụ di na nwunye na ndị di ha nwụrụ anwụ, na ọ ka mma ka ha nọdụ na-alụghị di maọbụ nwunye, dịka m onwe m nọ.
1CO 7:9 Ma ọ bụrụ na ha apụghị ijide onwe ha, ha gaa chọrọ di maọbụ nwunye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di maọbụ nwunye, karịa mmadụ ịgba ara site nʼagụụ nke anụ ahụ.
1CO 7:10 Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwunye niile, enwere m iwu m na-enye unu. (O sighị nʼaka m, kama o si nʼaka Onyenwe anyị): O kwesighị ka nwanyị ọbụla hapụ di ya.
1CO 7:11 A sịkwa na ọ hapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, maọbụ ya laghachikwuru di ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịgba nwunye ya alụkwaghị m.
1CO 7:12 Ma ana m agwa mmadụ ndị ọzọ (nke a abụghị iwu nke Onyenwe anyị nyere). Ọ bụrụ na nwanna alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dịka nwunye ya.
1CO 7:13 Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya alụkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ịnọgide dịka di ya.
1CO 7:14 Nʼihi na edoola di ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na nwunye ya, otu a kwa a na-edokwa nwunye ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na di ya, bụ onye kwere ekwe. Ọ bụrụ na ọ dịghị otu a, ụmụ unu ga-abụ ndị na-adịghị ọcha. Ma otu ọ dị, ha dị nsọ.
1CO 7:15 Ma ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe ekewapụ onwe ya, ya dịrị otu ahụ, nke a emeghị ka nwanna anyị nwoke maọbụ nwanna anyị nwanyị bụrụ ohu nʼọnọdụ dị otu a, nʼihi na Chineke kpọrọ anyị ka anyị bie ndụ udo.
1CO 7:16 Gị nwunye, ị mara maọbụ gị ga-azọpụta di gị? Ma, gị bụ di, si aṅa mara maọbụ gị ga-azọpụta nwunye gị?
1CO 7:17 Ka onye ọbụla bie ndụ ya dịka amara Onyenwe anyị nyere ya si dị, nakwa nʼọnọdụ nke Chineke kpọrọ ya. Nke a bụ iwu m na-enye nʼụlọ chọọchị niile.
1CO 7:18 Akpọrọ onye ọbụla mgbe e biri ya ugwu? Ya achọla iwepụ akara obibi ugwu ya. Ka onye a na-ebighị ugwu tupu ọkpụkpọ ya hapụ inye onwe ya nsogbu ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu.
1CO 7:19 Nʼihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ihe kachasị mkpa bụ idebe iwu Chineke.
1CO 7:20 Ka onye ọbụla nọgide dịka ọ dị mgbe a kpọrọ ya.
1CO 7:21 Ị bụ ohu mgbe a kpọrọ gị? Echegbula onwe gị nʼihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, were ohere ahụ mee ihe ugbu a.
1CO 7:22 Nʼihi na onye ọbụla Onyenwe anyị Chineke kpọrọ mgbe o bụ ohu, aghọọla onye nweere onwe ya nʼime Onyenwe anyị. Otu aka ahụ, onye nwerela onwe ya mgbe Onyenwe anyị kpọrọ ya aghọọla ohu nke Kraịst.
1CO 7:23 Akwụọla ụgwọ isi unu, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ.
1CO 7:24 Ụmụnna m, nʼọnọdụ ọbụla mmadụ nọ mgbe a kpọrọ ya, ya nọgidesie ike nʼime Chineke.
1CO 7:25 Ihe banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Enweghị m iwu ọbụla site nʼaka Onyenwe anyị banyere ajụjụ a, ma aga m ekwu uche nke aka m dịka onye sitere nʼebere nke Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi.
1CO 7:26 Echere m na ọ ka mma ugbu a, nʼihi nsogbu nke na-abịanụ ka onye ọbụla nọdụrụ onwe ya dịka o siri nọrọ ugbu a.
1CO 7:27 Ị lụọla nwanyị? Achọla nkewa. Ọ bụ na ị lụbeghị nwanyị? Ejela ịchọ onye ị ga-alụ.
1CO 7:28 Ma ọ bụrụ na i kpebie nʼobi gị ịlụ nwunye, i meghị mmehie ọbụla; ọ bụrụkwa na nwaagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe ọtụtụ nsogbu nʼime ụwa. Ọ ga-amasị m igbochiri unu nsogbu ndị ahụ.
1CO 7:29 Ihe unu kwesiri ịma, ụmụnna, bụ na oge anyị nwere fọdụrụ naanị ntakịrị, site ugbu a gaa nʼihu ndị nwere nwunye ga-adị ndụ ha dịka ndị na-enweghị.
1CO 7:30 Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dịka ndị ihe anaghị ewute, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dịka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọbụla.
1CO 7:31 Ka ndị na-etinye oge nʼihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe niile dị nʼụwa nʼuru. Nʼihi na ụwa, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga.
1CO 7:32 Unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya niile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.
1CO 7:33 Ma nwoke nwere nwunye na-echegbu onwe ya banyere ihe igbo mkpa nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ.
1CO 7:34 Ọ na-enwekwa obi abụọ nʼihe ọbụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nye nwaagbọghọ na-alụbeghị di maọbụ onye nke na-amabeghị nwoke, nchegbu ya bụ banyere ihe nke Onyenwe anyị. Ọchịchọ ya bụ ka ọ dị nsọ nʼanụ ahụ ya na nʼime mmụọ ya. Ma nwanyị nwere di na-echegbu onwe ya banyere ihe nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ di ya ụtọ.
1CO 7:35 Ana m ekwu ihe ndị a maka ọ dị mma nke unu onwe unu, ọ bụghị ịgbalị igbochi unu, kama ọ bụ ka unu nwee ike bie ndụ unu nʼụzọ kwesiri ekwesi, werekwa ịhụnanya zuruoke rụọra Onyenwe anyị ọrụ.
1CO 7:36 Ọ bụrụ na nwoke ọbụla enweghị ike ijide onwe ya nʼihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya nʼebe nwaagbọghọ ya na ya kpebiri ịlụ nọ, ya mee ihe ọ na-achọ, o meghị mmehie ọbụla, ha lụọ di na nwunye.
1CO 7:37 Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ekpebie nʼobi ya, ma nwee ike ijide onwe ya, ka o si nʼenweghị mmanye ọbụla idebe nwaagbọghọ e kwuru na ọ ga-alụ na-enweghị mmekọ ọbụla, ọ bụ ihe dị mma ka o mere.
1CO 7:38 Ya mere, onye ahụ lụrụ nwaagbọghọ o kwuru na ọ ga-alụ mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa.
1CO 7:39 Njikọta e jikọtara nwunye na di ya na-adị ire naanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ, ma ọ lụọ ya nʼime Onyenwe anyị.
1CO 7:40 Nʼuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nʼobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na mụ onwe m nwekwara Mmụọ nke Chineke.
1CO 8:1 Ugbu a, nʼokwu banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị ma na onye ọbụla nwere amamihe. Amamihe na-afụli mmadụ elu mee ka ọ nyaa isi. Ma ịhụnanya na-ewuli elu.
1CO 8:2 Ọ bụrụ na ọ dị onye sị na ya maara ihe niile, onye ahụ amatabeghị ihe o kwesiri ịmata.
1CO 8:3 Ma onye ahụ hụrụ Chineke nʼanya bụ onye ọ maara.
1CO 8:4 Ya mere, ihe banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị maara na “Arụsị abụghị ihe ọbụla nʼụwa”, matakwa na “Chi ọzọ adịghị ma ọ bụghị otu Chineke.”
1CO 8:5 A sịkwa na arụsị a na-akpọ chi dị, ma ha nọ nʼeluigwe maọbụ nʼụwa (nʼezie ọtụtụ “chi” na “ndị nwe mmadụ” dị otu a dị).
1CO 8:6 Ma nʼebe anyị nọ, anyị maara na ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye bụ Nna, onye kere ihe niile, na onye anyị na-adị ndụ nʼihi ya. Ọ bụkwa naanị otu Onyenwe anyị ka anyị nwere, onye bụ Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼaka ya kee ihe niile, onye na-enyekwa anyị ndụ.
1CO 8:7 Ma otu ọ dị, ọ bụghị onye ọbụla nwere ihe ọmụma a. Ụfọdụ nʼime ndụ ha niile, ha na-ele arụsị anya dịka chi dị ndụ. Ha na-echekwa na ihe ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja, na ọ bụ chi dị ndụ ka e ji ya chụọrọ aja. Nʼihi nke a, mgbe ọbụla ha riri ihe e ji chụọ aja nye arụsị, ọ na-ewute mmụọ ha nke ukwuu nʼihi na akọnuche ha esighị ike, ọ na-emerụkwa ya.
1CO 8:8 Ma ọ bụghị nri ga-eme ka anyị na Chineke dị na mma. Ma anyị riri ma anyị erighị, ọ dịghị ihe ọhụrụ anyị ga-enweta. Ọ dịkwaghị ihe na-efunarị anyị.
1CO 8:9 Ma lezienụ anya, otu o si dị, ka ike unu nwere ime ihe ọbụla dị unu mma, ghara ịghọ ihe ịsọ ngọngọ dịrị ndị na-adịghị ike nʼokwukwe ha.
1CO 8:10 Nʼihi na ọ bụrụ na ndị ọzọ ahụ gị, gị onye nwere akọnuche, ka ị nọ, na-eri nri nʼụlọ arụsị, ọ bụ na ha agaghị eche na ha bụ ndị okwukwe ha na-esighị ike, ga-enwe obi ike soro gị rie nri a gọrọ arụsị?
1CO 8:11 Nʼụzọ dị otu a, ndị kwere ekwe na-adịghị ike, ndị Kraịst nwụrụ nʼihi ha, na-esite nʼihe mmụta gị laa nʼiyi.
1CO 8:12 Cheta na ọ bụ mmehie i mere megide Kraịst, mgbe unu na-emegide mmụọ nwanne gị nʼime Kraịst, nʼihi nʼakọnuche ha esighị ike.
1CO 8:13 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ihe oriri ga-eme ka nwanna m mee mmehie, agaghị m eri anụ ọzọ, ka m ghara ime ka nwanna m maa nʼọnya.
1CO 9:1 Abụghị m onye nwe onwe ya? Abụghị m onyeozi Kraịst? Ọ bụ na m ahụghị Jisọs Onyenwe anyị? Unu abụghị ihe ngosipụta ọrụ m rụrụ nʼime Onyenwe anyị?
1CO 9:2 Ọ bụrụ na m abụghị onyeozi nʼebe ndị ọzọ nọ, nʼebe unu nọ, abụ m onyeozi nʼeziokwu nʼihi na unu bụ akara nke ọrụ onyeozi m nʼime Onyenwe anyị.
1CO 9:3 Ihe ngọpụ m nye ndị ahụ na-enyocha m bụ nke a.
1CO 9:4 Ọ bụ na anyị enweghị ike iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ?
1CO 9:5 Ọ bụ na anyị enweghị ike iduru nwunye onye bụ onye kwere ekwe gaa ebe ọbụla anyị na-aga dịka ndị ozi ọzọ na-eme, na dịka ụmụnne Onyenwe anyị na Sefas na-emekwa?
1CO 9:6 Ọ ga-abụ naanị mụ na Banabas bụ ndị na-enweghị ike ịhapụ ịrụ ọrụ maka ihe anyị ga na-eri?
1CO 9:7 Olee onye agha unu maara nke na-esi nʼakpa ya akwụ onwe ya ụgwọ ọnwa? Ka ọ dị onye ọrụ ubi vaịnị unu maara nke na-adịghị eri mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta? Olee onye ọzụzụ atụrụ unu maara nke na-adịghị aṅụ mmiri ara e si nʼigwe atụrụ ọ na-azụ apịpụta?
1CO 9:8 Anaghị m ekwu ihe a nʼihi na ha bụ ihe na-eme ụbọchị niile nʼetiti ndị mmadụ? Akwụkwọ iwu, o kwukwaghị otu ihe ahụ?
1CO 9:9 Nʼihi na e dere ya nʼiwu nke Mosis, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka.” Unu chere na ọ bụ naanị ehi ka Chineke bu nʼobi kwuo okwu a?
1CO 9:10 E, nʼihi anyị ka eji dee ya nʼakwụkwọ. Nʼezie, e dere ihe ndị a nʼihi anyị, nʼihi na onye rụrụ ọrụ nʼubi na onye na-azọcha mkpụrụ dị nʼubi ahụ, na-eme nke a nʼolileanya na o kwesiri iketa oke site na mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta.
1CO 9:11 Mkpụrụ anyị kụrụ nʼime obi unu bụ mkpụrụ nke mmụọ. Ọ ga-abụ ihe ọjọọ ma anyị sị unu nyetụ anyị ụfọdụ nʼime akụnụba unu?
1CO 9:12 Ọ bụrụ na ndị ọzọ kwesiri iketa uru dị otu a nʼahụ unu, ọ bụ na anyị ekwesighị iketa karịa? Ma ọ dịbeghị mgbe anyị rịọrọ unu ihe ọbụla, kama anyị na-agbalịsị ike ịhụ na ọ dịghị ihe ga-egbochi unu iji ezi obi na-ege ntị nʼoziọma Kraịst nke anyị wetara.
1CO 9:13 Ọ bụ na unu amataghị na ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu na-esi nʼụlọnsọ ahụ na-eweta ihe ha na-eri? Ndị na-agbakwa odibo nʼebe ịchụ aja na-eketakwa oke nʼihe eji chụọ aja?
1CO 9:14 Nʼotu aka ahụ kwa, Onyenwe anyị ekwuola na ndị niile na-ekwusa oziọma ya ga-esi nʼoziọma eweta nri ha ga-eri dị ndụ.
1CO 9:15 Ma o nweghị mgbe m jirila ike ndị a m nwere irite uru nʼọrụ m nara ndị mmadụ ihe. Anaghị m ede nke a nʼakwụkwọ ka a na-ebutere m ihe onyinye. Nʼihi na ọ kaara m mma ka m nwụọ kama m ga-ekwe ka onye ọbụla mee ka ịnya isi m bụrụ ihe efu nʼihi ihe onyinye.
1CO 9:16 Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma.
1CO 9:17 A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe ụgwọ ọrụ, ma na ọ bụrụ na o sighị nʼuche aka m, unu mara na-ahanyere m ya nʼaka.
1CO 9:18 Gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nʼizisa oziọma a, na-anaghị onye ọbụla ụgwọ ọrụ ọbụla, maọbụ ihe ruru m dịka onye na-ezisa oziọma ahụ.
1CO 9:19 Ọ bụ ezie na-abụghị m ohu onye ọbụla, ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ niile ka m nwee ike site nʼụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụobi nʼuru nye Kraịst.
1CO 9:20 Nʼebe ndị Juu nọọ, ana m eme dịka onye Juu, ka m nwee ike rite ndị Juu nʼuru. Nʼetiti ndị nọ nʼokpuru iwu, ana m emekwa dịka otu nʼime ndị nọ nʼokpuru iwu (nʼagbanyeghị na mụ onwe m anọghị nʼokpuru iwu), ka m si otu a nwee ike rite ndị nọ nʼokpuru iwu nʼuru.
1CO 9:21 Nʼebe ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nọ, emere m onwe m ka onye na-anọghị nʼokpuru iwu (ma nke a apụtaghị na m na-akwụsị ime ihe iwu Chineke na-achọ. Ana m emekwa dịka onye nọ nʼokpuru iwu Kraịst), ka m nwee ike rite ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nʼuru.
1CO 9:22 Nʼebe ndị na-adịghị ike nọ, ana m emekwa dịka ha, ka m nwee ike rite ndị na-adịghị ike nʼuru. Otu ọbụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike site nʼụzọ niile ọbụla zọpụta ụfọdụ.
1CO 9:23 Ana m eme ihe ndị a niile nʼihi oziọma, ma ka m nwekwa ike keta oke na ngọzị ya.
1CO 9:24 Unu amataghị na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ naanị otu onye na-enwe ihe onyinye nke mbụ? Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta onyinye ahụ.
1CO 9:25 Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ntachiobi nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi.
1CO 9:26 Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nʼazụ, maọbụ kụọ ọkpọ dịka m na-akụ ifufe.
1CO 9:27 Ma ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ mee ya ka ọ bụrụ ohu, ka mụ onwe m ghara ị bụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịrị oziọma nye ndị ọzọ.
1CO 10:1 Ụmụnna m, achọghị m ka unu chefuo ihe mere nna nna anyị ha mgbe ha jere ije nʼime ọzara. O ji igwe ojii duo ha. O mekwara ka ha si nʼetiti Osimiri Uhie gafee.
1CO 10:2 Nʼime igwe ojii ahụ, na nʼime osimiri ahụ e tinyere ha niile na baptizim, dịka ndị na-eso ụzọ Mosis.
1CO 10:3 Ha niile rikwara ihe oriri nke mmụọ ahụ.
1CO 10:4 Ha ṅụkwara mmiri mmụọ ahụ, mmiri sitere nʼoke nkume mmụọ ahụ, nke na-eso ha. Oke nkume ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya.
1CO 10:5 Nʼihe ndị a niile, omume ha amasịghị Chineke. Nʼihi nke a, ọ lara ha nʼiyi nʼime ọzara.
1CO 10:6 Ugbu a, ihe ndị a niile bụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye anyị, ka anyị hapụ ịbụ ndị agụụ ime ihe ọjọọ na-agụ dịka ha.
1CO 10:7 Unu abụla ndị na-ekpere arụsị dịka ụfọdụ ha mere. Dịka e dere ya, “Ndị a nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.”
1CO 10:8 Ka anyị ghara ịkwa iko dịka ụfọdụ nʼime ha mere, iri puku mmadụ abụọ na atọ nʼime ha nwụọ nʼotu ụbọchị.
1CO 10:9 Ka anyị hapụ ịnwa Kraịst ọnwụnwa dịka ụfọdụ nʼime ha si nwaa Chineke. E mere ka agwọ tagbusie ha.
1CO 10:10 Ka anyị hapụkwa itamu ntamu dịka ụfọdụ ha mere ma bụrụ ndị Mmụọ ozi ọnwụ tigburu.
1CO 10:11 Ihe ndị a niile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị. E dekwara ha nʼakwụkwọ ka ha bụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị nʼihi na anyị bi nʼoge a mgbe ọgwụgwụ ihe niile dị nso.
1CO 10:12 Ya mere, ọ bụrụ na ị na-eche na ị guzosiri ike, lezie anya ka ị ghara ịda.
1CO 10:13 O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ọ ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya.
1CO 10:14 Ya mere, ndị enyi m hụrụ nʼanya, gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ.
1CO 10:15 Ana m agwa ndị nwere uche okwu, unu onwe unu tulenụ ihe m na-ekwu.
1CO 10:16 Iko ngọzị ahụ nke anyị na-agọzi, ọ bụghị iketa oke site nʼọbara Kraịst? Achịcha nke anyị na-anyawa, ọ bụghị iketa oke nʼahụ Kraịst?
1CO 10:17 Nʼihi na otu achịcha dị, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ, nʼihi na anyị niile na-eketa oke nʼotu ogbe achịcha ahụ.
1CO 10:18 Chetanụ ka ndị Izrel siri mee: ọ bụ na ndị na-eri ihe eji chụọ aja abụghị ndị nnwekọ nʼebe ịchụ aja?
1CO 10:19 Gịnị ka okwu ndị a m na-ekwu pụtara? Na arụsị, maọbụ ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị bụ ihe ọbụla, maọbụ na ọ bụghị ihe?
1CO 10:20 Mba! Ihe m na-ekwu bụ na ndị niile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nʼotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ. Ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu.
1CO 10:21 Unu apụghị ịṅụ site nʼiko Onyenwe anyị ma ṅụọkwa site nʼiko ekwensu; unu apụghịkwa inwe oke site na tebul Onyenwe anyị na tebul ekwensu.
1CO 10:22 Anyị na-achọ ime ka iwe wee Onyenwe anyị? Anyị dị ike karịa ya?
1CO 10:23 Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma ọ bụghị ihe niile nwere ike inyere anyị aka.
1CO 10:24 Ka onye ọbụla hapụ ịchọ ọdịmma nke onwe ya, kama ọdịmma nke ndị ọzọ.
1CO 10:25 Rie ihe bụ anụ ọbụla e rere nʼahịa na-ajụghị ajụjụ ọbụla nʼihi akọnuche.
1CO 10:26 Nʼihi na, “Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị.”
1CO 10:27 Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ unu oriri, unu kpebie ije, riekwanụ nri ọbụla e nyere unu na-ajụghị ajụjụ nʼihi akọnuche.
1CO 10:28 Ma ọ buru na e nwee onye gwara gị, “A chụrụ ihe a nʼaja.” Unu erila nri ahụ, maka onye ahụ mere ka unu mata, na nʼihi akọnuche.
1CO 10:29 Akọnuche nke m na-ekwu maka ya abụghị nke gị, kama ọ bụ maka nke onye ahụ. Nʼihi gịnị ka mnwere onwe m ga-eji bụrụ ihe akọnuche onye ọzọ ga-ekpe ikpe?
1CO 10:30 Ọ bụrụ na m nwere ike inye ekele, were nri m rie, olee otu e si ekwutọ m nʼihi ihe ahụ m nyere Chineke ekele banyere ya?
1CO 10:31 Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke.
1CO 10:32 Unu emejọla ndị Juu maọbụ ndị Griik, ma ọ bụkwanụ nzukọ Chineke.
1CO 10:33 Na-agbalịsinụ ike ime dịka m si eme. Nʼihe ọbụla m na-eme, ana m ejisi ike ime ihe ga-atọ onye ọbụla ụtọ. Anaghị m achọ ọdịmma nke m naanị, kama ọ bụ ọdịmma nke mmadụ ibe m, ime ka a zọpụta ha.
1CO 11:1 Unu bụrụ ndị na-eṅomi m, dịka m si eṅomi Kraịst.
1CO 11:2 Ana m aja unu nʼihi na unu na-echeta m nʼihi niile, nakwa nʼihi na unu na-ejisikwa ozizi ahụ enyere unu nʼaka ike, dịka m nyere ha nʼaka unu idebe.
1CO 11:3 Ma achọrọ m ka unu mata na dịka Kraịst bụ isi nwoke ọbụla, otu a ka nwoke ọbụla si bụrụ isi nwunye ya. Chineke bụkwa isi Kraịst.
1CO 11:4 Nwoke ọbụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma na-emenye isi ya ihere.
1CO 11:5 Ma nwanyị ọbụla na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma, ma o kpuchighị isi ya, na-emenye isi ya ihe ihere, nʼihi na ọ dịka nwanyị kpụchara isi ya.
1CO 11:6 Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla achọghị ikechi isi ya, ya kpụchaa ya. A sịkwa na ọ bụkwanụ ihe ihere na nwanyị kpụchara isi ya, ka nwanyị kechie isi ya.
1CO 11:7 Ma nwoke ekwesighị ikpuchi isi ya, nʼihi na nwoke bụ onyinyo na otuto nke Chineke, ebe nwanyị bụ otuto nke nwoke.
1CO 11:8 E si na nwoke kee nwanyị, ma e sighị na nwanyị kee nwoke.
1CO 11:9 E keghị nwoke maka nwanyị, ma e kere nwanyị maka nwoke.
1CO 11:10 Nʼihi nke a, nwanyị kwesiri ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nʼokpuru di ya, maka ndị mmụọ ozi.
1CO 11:11 Ma otu ihe si dị nʼime ndụ anyị na-adị nʼime Onyenwe anyị, nwoke adịghị ma e wepụ nwanyị, nwanyị adịghịkwa ma e wepụ nwoke.
1CO 11:12 Nʼihi na dịka nwanyị siri na nwoke pụta na mbụ, otu a ka a na-esitekwa nʼahụ nwanyị mụpụta nwoke. Ma ha niile si nʼaka Chineke pụta.
1CO 11:13 Achọrọ m ka unu tule ihe a nʼonwe unu, ọ dị mma ka nwanyị ghebe isi ya oghe mgbe ọ na-ekpe ekpere nye Chineke?
1CO 11:14 Unu matakwara nke ọma na ọ bụ ihe ihere na nwoke ga-ebu agịrị isi dị ogologo.
1CO 11:15 Ma ọ bụrụ na nwanyị enwee agịrị isi dị ogologo ọ bụ ihe otuto nye ya nʼihi na e nyere ya agịrị isi dị ogologo ka ọ bụrụ ihe mkpuchi.
1CO 11:16 Ọ bụrụ na onye ọbụla na-arụ ụka banyere omenaala nke a, anyị onwe anyị na nzukọ Chineke niile enweghị omenaala ọzọ banyere nke a.
1CO 11:17 Nʼime ntụziaka ndị a, enweghị m otuto nye unu nʼihi na mgbe unu zukọtara omume unu na-eweta ihe ọjọọ karịa ihe ọma.
1CO 11:18 Na mmalite, ihe m na-anụ bụ na mgbe niile unu zukọrọ dịka chọọchị, ịrụ ụka nke na-ebute nkewa na-adị nʼetiti unu. E kwenyekwara m na ụfọdụ ihe ndị a m nụrụ bụ eziokwu.
1CO 11:19 Nʼezie ụdị nkewa dị otu a aghaghị ịdị nʼetiti unu ka e nwee ike mara ndị Chineke nabatara.
1CO 11:20 Mgbe unu zukọtara, ọ bụghị nri anyasị nke Onyenwe anyị ka unu na-eri.
1CO 11:21 Nʼihi na mgbe unu na-eri nri, ụfọdụ nʼime unu na-eri nri anyasị nke aka ha. Nke mere, nʼotu onye na-anọ agụụ ebe onye ọzọ na-aṅụbigakwa mmanya oke.
1CO 11:22 A ga-akpọ nke a gịnị? Ọ bụ na unu enweghị ụlọ ebe unu ga-anọ rijuo afọ ma ṅụjuokwa afọ? Ka ọ bụ na unu na-elelị nzukọ Chineke na emenye ndị na-enweghị ihe ihere? Gịnị ka m ga-agwa unu? Aga m eto unu maka nke a? Agaghị m eto unu maka nke a.
1CO 11:23 Nʼihi na ihe m ziri unu bụ ihe Onyenwe anyị ziri m. Nʼabalị ụbọchị ahụ a rara ya nye, Onyenwe anyị Jisọs weere otu ogbe achịcha.
1CO 11:24 Mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya sị, “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye maka unu. Na-emenụ nke a iji cheta m.”
1CO 11:25 Nʼụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risiri nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m. Oge ọbụla unu na-aṅụ ya, na-emenụ nke a iji na-echeta m.”
1CO 11:26 Nʼihi na mgbe ọbụla unu na-eri achịcha ahụ na-aṅụkwa iko a, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa ọzọ.
1CO 11:27 Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha Onyenwe anyị maọbụ ṅụọ iko Onyenwe anyị nʼụzọ na-ekwesighị ekwesi, onye ahụ na-emehie megide anụ ahụ Onyenwe anyị na ọbara Onyenwe anyị.
1CO 11:28 Ọ bụ nke a mere o ji bụrụ ihe dị mkpa ka onye ọbụla nyochaa onwe ya nke ọma tupu o rie achịcha ahụ maọbụ ṅụọ iko ahụ.
1CO 11:29 Nʼihi na onye ọbụla na-eri achịcha ahụ maọbụ ṅụọ site nʼiko ahụ na-echeghị echiche, ọ na-eri, na-aṅụtakwara onwe ya ikpe ọmụma, ma ọ bụrụ na ọ tuleghị uche banyere ahụ Kraịst.
1CO 11:30 Ọ bụ nke a mere ọtụtụ nʼime unu ji bụrụ ndị ahụ na-esighị ike, ndị nọ nʼọrịa na ndị dara nʼụra ọnwụ.
1CO 11:31 Ọ bụrụ na anyị enyochaa onwe anyị nke ọma, anyị agaghị adaba nʼikpe.
1CO 11:32 Ma otu ọ dị, mgbe Onyenwe anyị na-ama anyị ikpe nʼụzọ dị otu a, a na-ezi anyị otu e si ebi ezi ndụ nʼihi ka a ghara ịmakọ anyị na ndị ụwa ikpe.
1CO 11:33 Ya mere, ụmụnna m, mgbe unu bịakọtara iri nri, cherenụ ibe unu.
1CO 11:34 Ọ bụrụ na agụụ agụọ onye ọbụla ya rie nri nʼụlọ ya, ka ọ hapụ iwetara unu ikpe ọmụma. Aga m enye ntụziaka banyere ihe niile ndị ọzọ mgbe m bịara.
1CO 12:1 Ugbu a ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe gbasara onyinye nke Mmụọ Nsọ na-enye.
1CO 12:2 Unu matara na mgbe unu bụ ndị na-amaghị Chineke, e duru unu nʼotu ụzọ maọbụ nke ọzọ, duhie unu ụzọ iso arụsị ndị ahụ dara ogbi.
1CO 12:3 Ya mere, achọrọ m ka unu ghọta nke ọma na ọ dịghị onye ọbụla na-ekwu okwu site nʼodudu Mmụọ nke Chineke, pụrụ ị sị, “Ka Jisọs bụrụ onye a bụrụ ọnụ.” Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ikwu, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” ma ọ bụghị site na Mmụọ Nsọ.
1CO 12:4 Onyinye amara dị iche iche dị, ma otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha niile.
1CO 12:5 E nwekwara ụdị ije ozi dị iche iche, maọbụ otu Onyenwe anyị ahụ ka a na-ejere ozi.
1CO 12:6 Ụdị ike dị iche iche nke eji arụ ọrụ dịkwa, ma otu Chineke ahụ na-etinye ike ndị a nʼime onye ọbụla iji jee ozi.
1CO 12:7 Ọ na-enyekwa onye ọbụla amara izipụta ike nke Mmụọ Nsọ maka ọdịmma mmadụ niile.
1CO 12:8 Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, site nʼotu Mmụọ ahụ.
1CO 12:9 Otu Mmụọ nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa.
1CO 12:10 Onye ọzọ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, onye ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọkwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu.
1CO 12:11 Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a niile. Ọ na-enye onye ọbụla onyinye dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ si kpebie.
1CO 12:12 Dịka ahụ anyị si nwe akụkụ dị iche iche, ma bụrụkwa otu ahụ, nʼagbanyeghị na o nwere ọtụtụ akụkụ, otu a ka anụ ahụ Kraịst dịkwa.
1CO 12:13 Site nʼotu Mmụọ Nsọ ahụ ka e mere anyị niile baptizim nʼotu nʼotu, ma ndị Juu ma ndị Griik, ma ohu ma ndị nwe onwe ha. E meela ka anyị ṅụọ ọbara ya, nʼime njikọ nke otu Mmụọ Nsọ ahụ.
1CO 12:14 Ahụ mmadụ abụghị naanị otu akụkụ, kama o nwere ọtụtụ akụkụ ahụ.
1CO 12:15 Ọ bụrụ na ụkwụ asị, “Nʼihi na-abụghị m aka, esoghị nʼahụ,” nke a agaghị egbochi ya ka ọ gharakwa ịbụ otu nʼakụkụ anụ ahụ.
1CO 12:16 Otu a kwa, ọ bụrụ na ntị asị, “Ebe m na-abụghị anya abụghị m otu akụkụ anụ ahụ.” Okwu a kwa agaghị eme ka ntị ghara ịbụ akụkụ anụ ahụ.
1CO 12:17 Ọ bụrụ na ahụ niile bụ anya, olee ka ahụ ga-esi nụ ihe? Ọ bụrụkwa na ahụ mmadụ bụ naanị ntị ọ ga-esi aṅaa nụ isisi ihe ọbụla?
1CO 12:18 Ma otu ihe si dị, Chineke debere nʼotu nʼotu akụkụ niile dị nʼahụ dịka o si chọọ.
1CO 12:19 A sị na akụkụ niile dị nʼahụ bụ otu ihe, kedụ ebe ahụ ga-adị?
1CO 12:20 Otu ọ dị, ọ bụ ezie na ihe dị nʼahụ dị ọtụtụ, ma ha niile bụ otu ahụ.
1CO 12:21 Nʼihi nke a, anya enweghị ike ịgwa aka sị, “Achọghị m gị, nʼihi na ị dịghị m mkpa.” Isi agakwaghị agwa ụkwụ sị, “Achọghị m inyeaka gị.”
1CO 12:22 Kama ọ bụ akụkụ ahụ anyị ndị na-esighị ike bụ ndị dị anyị mkpa karịa.
1CO 12:23 E e, akụkụ ndị ahụ anyị na-eche na ha adịghị mkpa ka anyị na-eji nsọpụrụ na-elekọta. Akụkụ ndị ahụ na-ekwesighị ile anya ka anyị na-enye ugwu, ma na-ekpuchi ha.
1CO 12:24 Ma anyị adịghị esi otu a elekọta akụkụ ahụ ndị ahụ anya na-ahụ nʼụzọ pụrụ iche, nʼihi na Chineke kpachapụrụ anya mee ka akụkụ ndị ahụ dịkarịsịrị nta bụrụ nke anyị kwesiri inye nsọpụrụ karịa.
1CO 12:25 Nʼụzọ dị otu a, nkewa ọbụla adịghị nʼahụ mmadụ. Akụkụ ọbụla maara mkpa ibe ya, ha na-egborịtakwara onwe ha mkpa ha.
1CO 12:26 Ọ bụrụ na otu akụkụ enwe nsogbu, akụkụ ndị ọzọ ga-eketa oke na nsogbu ahụ. Ọ bụrụkwa na otu akụkụ emee ihe ga-eweta otuto ọ bụ ahụ niile na-enwe otuto ahụ.
1CO 12:27 Ugbu a, unu niile nʼotu nʼotu bụ otu anụ ahụ Kraịst. Unu bụkwa akụkụ ahụ ya nʼotu nʼotu, bụrụkwa ndị dị mkpa nʼahụ ahụ.
1CO 12:28 Nke a bụ ụfọdụ nʼime akụkụ dị iche iche Chineke tinyere na chọọchị; nke mbụ bụ ndị ozi, ndị amụma, ndị nkuzi, ndị na-arụ ọrụ ịtụnanya, ndị na-agwọ ọrịa, ndị pụrụ inyere mmadụ ibe ha aka, ndị nwere onyinye ịchịkọta ihe niile nʼusoro, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche.
1CO 12:29 Ha niile, ha bụ ndị ozi? Ha niile ha bụ ndị amụma? Ha niile ha bụ ndị nkuzi? Ha niile ha bụ ndị ọrụ ebube?
1CO 12:30 Ha niile ha nwere onyinye ịgwọ ọrịa? Ha niile ha na-asụ nʼolu dị iche iche? Ha niile ha nwere onyinye nke ịkọwa asụsụ dị iche iche?
1CO 12:31 Ugbu a, gbalịsienụ ike inweta onyinye kachasị dị elu karịa. Ma aga m ezi unu ụzọ nke kachasị ihe a niile mma.
1CO 13:1 A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda.
1CO 13:2 A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe niile gaje ime nʼoge dị nʼihu, na onye maara ihe niile, a sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nʼebe ọ nọ gaa nʼebe ọzọ, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụghị m ihe ọbụla.
1CO 13:3 A sịkwa na m ewere ihe niile m nwere nye ndị ogbenye, werekwa anụ ahụ m nye ka ere ya ọkụ nʼihi ka m nyaa isi, ihe ndị a niile abaghị uru, ma m enweghị ịhụnanya.
1CO 13:4 Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.
1CO 13:5 Ọ naghị eme ihe na-akpasu iwe, ọ naghị achọ ihe nke naanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ niile e mere ya.
1CO 13:6 Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama ọ na-aṅụrị nʼeziokwu.
1CO 13:7 Ọ na-edi ihe niile, ọ na-ekwerekwa ihe niile, ọ na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara.
1CO 13:8 Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma niile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma niile ga-agabiga.
1CO 13:9 Nʼihi na ọmụma anyị ezughị oke, ibu amụma anyị ezukwaghị oke.
1CO 13:10 Ma mgbe anyị ruru nʼizuoke, ezughị oke agaghị adịkwa.
1CO 13:11 Mgbe m bụ nwata, ekwuru m okwu dịka nwata, echiche m niile bụ echiche nwata. Izuzu obi m niile bụkwa nke nwata. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịghịkwa m akpa agwa dịka nwata ọzọ.
1CO 13:12 Ugbu a, anyị na-ahụ inyogho inyogho dịka anyị na-ele anya nʼenyo ma mgbe ahụ anyị ga-ahụ ihu na ihu. Ugbu a, ihe m mara ezughị oke, ma mgbe ahụ aga m amazu, dịka m bụ onye a mazuru.
1CO 13:13 Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nʼime ha niile, ihe kachasị ha niile bụ ịhụnanya.
1CO 14:1 Ka ịhụnanya bụrụ isi ihe unu na-achọ. Chọsienụ onyinye nke Mmụọ Nsọ ike, nke ka nke onyinye inwe ike ibu amụma.
1CO 14:2 Onye ọbụla na-asụ asụsụ ọ na-amụghị amụ, bụ Chineke ka ọ na-agwa okwu, ọ bụghị mmadụ. Nʼezie, ọ dịghị onye na-aghọta ihe ọ na-ekwu; nʼihi na okwu ọ na-ekwu bụ ihe omimi site nʼike Mmụọ Nsọ.
1CO 14:3 Ma onye ọbụla na-ebu amụma na-ezisa ozi na-enyere ndị mmadụ aka ito eto. Ọ na-agwakwa ha okwu nkasiobi na okwu na-ebuli mmụọ ha elu.
1CO 14:4 Ya mere, onye ahụ na-ebu amụma na-enyere chọọchị aka, ma onye ahụ na-asụ asụsụ ọzọ, na-enyere naanị onwe ya aka.
1CO 14:5 Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu niile nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche; ma ọ ga-atọ m karịa ma ọ bụrụ na unu niile enwee onyinye ibu amụma. Nke a bụ nʼihi na onye ahụ na-ebu amụma bara uru karịa onye na-asụ asụsụ dị iche iche. Ịsụ asụsụ ya ga-aba uru ma ọ bụrụ na ọ dị onye na-aghọta ihe ọ na-asụ, ka e nwee ike wulie chọọchị.
1CO 14:6 Ụmụnna m ọ bụrụ na m bịakwutere unu malite ịsụ asụsụ unu na-adịghị aghọta, ole uru m baara unu, ma ọ bụghị ma m na-ekwu okwu banyere ihe ekpughere gosi m, maọbụ ihe niile m maara, maọbụ ihe gaje ime, maọbụ ihe nkuzi?
1CO 14:7 Ọ bụkwa otu a ka ọ dị nʼetiti ihe niile na-enweghị ndụ, nke na-ada ụda, dịka ọja, maọbụ ụbọ akwara. Ọ bụrụ na ha enyeghị ụda dị iche site na nke ọzọ, olee ụzọ mmadụ ga-eji mara maọbụ ọja ka a na-afụ, maọbụ ụbọ akwara ka a na-akpọ.
1CO 14:8 Ọ bụrụkwa na opi ike e ji akpọ ndị agha oku adapụtaghị ụda nke ọma, onye ga-ejikere ije agha?
1CO 14:9 Nʼotu aka ahụ kwa, ọ bụrụ na ị na-agwa mmadụ okwu nʼasụsụ ọ na-adịghị anụ, olee otu ọ ga-esi ghọta ihe ị na-ekwu? Nʼoge ahụ, ifufe ka unu na-agwa okwu.
1CO 14:10 Asụsụ a na-asụ nʼụwa a dị ukwuu, ma ha niile bara uru nye ndị na-anụ ha.
1CO 14:11 Ọ bụrụ na m aghọtaghị ihe onye na-asụ otu nʼime asụsụ ndị a na-ekwu, aga m abụ ọbịa nʼebe onye na-asụ asụsụ ahụ nọ, ya onwe ya ga-abụkwa ọbịa nʼebe m nọ.
1CO 14:12 Ebe ọ na-agụ unu agụụ inweta onyinye nke Mmụọ Nsọ, chọọnụ onyinye ndị ahụ ga-enyere unu aka iwuli nzukọ elu.
1CO 14:13 Onye ọbụla na-asụ asụsụ nʼolu dị iche iche, ga-ekpe ekpere ka e nye ya onyinye ịkọwa olu dị iche iche.
1CO 14:14 Ọ bụrụ na m ji asụsụ dị iche na-ekpe ekpere, mmụọ m ga-eso m na-ekpe ekpere ahụ, ma uche m agaghị aghọta ekpere m na-ekpe.
1CO 14:15 Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ihe m ga-eme? Aga m eji mmụọ m kpee ekpere, jirikwa uche kpee ekpere. Aga m ejikwa mmụọ m bụọ abụ, jirikwa uche m bụọ abụ.
1CO 14:16 Ma o bụghị otu a, mgbe i ji asụsụ ọzọ nke a na-amaghị na-eto Chineke nʼime mmụọ, olee otu ndị niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ na-aghọtaghị ihe ị na-ekwu ga-esi zaa Amen?
1CO 14:17 Ọ bụ ezie na ị na-enye ekele nke ọma, ma ọ naghị ewuli onye ọbụla elu.
1CO 14:18 Ana m ekele Chineke nʼihi na ana m asụ asụsụ dị iche iche karịa unu niile.
1CO 14:19 Ma mgbe ọbụla a gbakọrọ na nzukọ ife ofufe, ọ na-akara m mma ikwu naanị mkpụrụ okwu ise nke mmadụ niile ga-aghọta na nke ga-abakwara ha uru, karịa na m kwuru puku mkpụrụ okwu iri nʼasụsụ dị iche iche nke onye ọbụla na-apụghị ịghọta.
1CO 14:20 Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nʼechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nʼihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nʼihe gbasara ụdị okwu a.
1CO 14:21 E dere ya nʼakwụkwọ iwu, “Site na egbugbere ọnụ ndị mba ọzọ sitekwa nʼire ndị na-asụ iche iche ka m ga-agwa ndị a okwu, ma ọbụladị otu a, ha agaghị ege m ntị, ka Onyenwe anyị kwuru.”
1CO 14:22 Ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe nlere anya nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma bụ maka ndị kwere ekwe, ọ bụghị maka ndị na-ekweghị ekwe.
1CO 14:23 Ọ bụrụ na nzukọ niile ezukọọ nʼọgbakọ ekpere, mmadụ niile a na-asụ nʼolu dị iche iche nʼotu mgbe, ọ bụrụkwa na ndị na-aghọtaghị, maọbụ ndị na-ekweghị ekwe abata nʼebe ahụ, gịnị ka ha ga-ekwu? Ha ọ gaghị asị na isi emebiela ndị a?
1CO 14:24 Ma ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe maọbụ onye ọhụrụ abata mgbe onye ọbụla na-ebu amụma, ha ga-abụ ndị mmadụ niile ga-atụ mmehie ha nʼanya maakwa ha ikpe mmehie.
1CO 14:25 Mgbe a na-eme ka ihe nzuzo nke obi ha niile pụta ìhè, onye dị otu a ga-egbu ikpere nʼala kpọọ isiala nye Chineke sị, “Nʼezie, Chineke nọ nʼetiti unu.”
1CO 14:26 Ugbu a, ụmụnna m, kedụ otu o kwesiri ịdị? Mgbe ọbụla unu zukọrọ, ụfọdụ kwesiri ịbụ abụ, onye ọzọ ga-ezi unu ihe; maọbụ gwa unu ozi dị mkpa e gosiri ya, maọbụ jiri asụsụ nke ọ na-amụghị gwa unu okwu, ka onye ọzọ kọwaa ihe onye ji asụsụ a dị iche kwuo okwu kwuru. Ma ka ihe ọbụla e mere nʼime ụlọ chọọchị bụrụ ihe ga-ewuli onye ọbụla elu.
1CO 14:27 A sịkwa na ọ dị ndị chọrọ iji asụsụ dị iche kwuo okwu, ka mmadụ abụọ maọbụ atọ kwuo. Kama ka ha kwuo nʼotu nʼotu nʼusoro. Ka onye ga-akọwa ihe ha kwuru nọrọkwa nʼebe ahụ.
1CO 14:28 Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche na chọọchị mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịta ya.
1CO 14:29 Ka mmadụ abụọ maọbụ atọ nwere onyinye ibu amụma kwuo okwu nʼotu nʼotu, ka ndị ọzọ tulee ihe ha kwuru.
1CO 14:30 Ọ bụrụ na-ekpughere onye ọzọ nọdụ nʼakụkụ ya ihe, ka onye mbụ mechie ọnụ ya.
1CO 14:31 Nʼihi na unu nwere ike ibu amụma nʼotu nʼotu, ka mmadụ niile nwee ike ịmụta ihe ma bụrụkwa ndị a gbara ume.
1CO 14:32 Mmụọ niile nke ndị amụma ka a na-edokwa nʼokpuru ndị amụma.
1CO 14:33 Nʼihi na Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama ọ bụ nke udo. Otu a ka ọ dị nʼime ọgbakọ niile nke ndị nsọ.
1CO 14:34 Ụmụ nwanyị ekwesighị ikwu okwu nʼime chọọchị. Ha ekwesighị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọbụla, nʼihi na iwu kwuru ka ha debe onwe ha nʼokpuru ndị ọchịchị.
1CO 14:35 Ọ bụrụ na ọ dị ihe ha chọrọ ịmata, ha jụọ di ha mgbe ha lara nʼụlọ. Nʼihi na ọ bụ ihe ihere na nwanyị ga-ekwu okwu nʼime ọgbakọ chọọchị.
1CO 14:36 Unu chere na okwu Chineke malitere nʼaka unu? Unu chekwara na ọ ga-akwụsị nʼaka unu? Ụgha!
1CO 14:37 Ọ bụrụ na ọ dị onye na-eche na ya bụ onye amụma, maọbụ na ya nwere onyinye nke Mmụọ Nsọ, naanị ihe m na-achọ ka ọ ghọta bụ na ihe m na-edere unu bụ iwu Onyenwe anyị nʼonwe ya nyere m.
1CO 14:38 Ọ bụrụ na ọ dị onye nọgidere jụ ịnabata ihe ndị a, unu aṅala ya ntị.
1CO 14:39 Ya mere, ụmụnna m, ka ibu amụma bụrụ ihe na-agụ unu agụụ, unu egbochikwala onyinye nke ịsụ nʼire dị iche iche.
1CO 14:40 Ma meenụ ihe niile nʼụzọ dị mma, ka ha dịkwa nʼusoro.
1CO 15:1 Ụmụnna m, ugbu a achọrọ m ime ka unu cheta oziọma ahụ m ziri unu mgbe m buru ụzọ bịakwute unu, nke unu kweere na ya, na nke unu guzosikwara ike nʼelu ya.
1CO 15:2 E si nʼoziọma a zọpụta unu, ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile jidesie ihe unu kweere na ya ike. Inwe okwukwe nʼihe ọzọ dị iche agaghị enyere unu aka.
1CO 15:3 Ihe m nyefere unu nʼaka na mbụ bụ ozi ahụ m natara ị debe, nke dị oke mkpa, na Kraịst nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie anyị, dịka akwụkwọ nsọ kwuru na ọ ga-anwụ.
1CO 15:4 Na e liri ya, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ, dịka akwụkwọ nsọ kwukwara na ọ ga-eme.
1CO 15:5 O gosiri Sefas onwe ya, emesịa, ndị ozi iri na abụọ ahụ hụkwara ya.
1CO 15:6 Emesịakwa, o gosiri ihe karịrị narị mmadụ ise nʼime ụmụnna onwe ya, nʼotu mgbe, ọtụtụ nʼime ndị ahụ ka nọ ndụ taa, ọ bụ ezie na ụfọdụ nʼime ha adaala nʼụra ọnwụ.
1CO 15:7 Emesịa, Jemis hụrụ ya; o mekwara ka ndị ozi niile hụ ya.
1CO 15:8 Nʼikpeazụ, mụ onwe m hụkwara ya, dịka a ga-asị na m bụ nwa a na-amụghị nʼoge.
1CO 15:9 Nʼihi na ọ bụ m kachasị nta nʼime ndị ozi. O kwesikwaghị ka a akpọọ m onyeozi ya nʼihi na alụsoro m nzukọ Chineke ọgụ nke ukwuu.
1CO 15:10 Ma site nʼamara nke Chineke, abụ m ihe m bụ. Ọ pụtakwara na amara ya nʼebe m nọ abụghị ihe efu. Kama arụsịrị m ọrụ ike karịchasịa ndị ozi niile. Ma nʼezie, ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ ya nʼime m.
1CO 15:11 Ma ọ bụ m, maọbụ ndị ọzọ, otu a ka anyị siri kwusaa, otu a ka unu sikwa kwere.
1CO 15:12 Ma ọ bụrụ na a na-ekwusa na Kraịst si nʼọnwụ bilie, gịnị mere ụfọdụ unu ji na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ apụghị isi nʼọnwụ bilie ọzọ.
1CO 15:13 Ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ a pụghị i si nʼọnwụ bilie, nke a pụtara na e meghị ka Kraịst site nʼọnwụ bilie.
1CO 15:14 Ọ bụrụkwa na e meghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, ihe anyị na-ezisa bụ ihe efu, okwukwe unu nwere bụkwa ihe efu.
1CO 15:15 Ma karịa nke a, a na-ahụta anyị ka ndị ama ụgha nke Chineke, nʼihi na anyị gbara ama banyere Chineke, na-asị na o mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, bụ onye ọ na-emeghị ka o si nʼọnwụ bilie ma ọ bụrụ na-emeghị ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ.
1CO 15:16 Nʼihi na, ọ bụrụ na a pụghị ime ka ndị nwụrụ anwụ bilie dị ndụ ọzọ, emekwaghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie.
1CO 15:17 Ma ọ bụrụ na-emeghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, okwukwe unu bụ ihe efu, unu ka ga-anwụ na mmehie unu.
1CO 15:18 Mgbe ahụ ndị nwụrụ anwụ nʼime Kraịst lara nʼiyi.
1CO 15:19 Ọ bụrụkwa na olileanya anyị nʼime Kraịst gwụrụ naanị na ndụ anyị nʼime ụwa a, anyị bụ ndị e kwesiri ka e mere ebere.
1CO 15:20 Ma e mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie nʼezie, onye mbụ nʼetiti ndị niile nwụrụ anwụ.
1CO 15:21 Nʼihi na dịka ọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa, otu a kwa ka mbilite nʼọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa.
1CO 15:22 Dịka mmadụ niile si anwụ site nʼaka Adam, otu a kwa ka mmadụ niile ga-esi dịkwa ndụ nʼime Kraịst.
1CO 15:23 Onye ọbụla ga-ebili nʼusoro nke ya, Kraịst mkpụrụ mbụ si nʼọnwụ bilie. Mgbe ọ lọghachiri, ndị niile bụ ndị nke Kraịst ga-esote.
1CO 15:24 Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ ihe niile ga-abịa, mgbe ọ ga-enyefe alaeze nʼaka Chineke bụ Nna, nʼihi na o meriela ịchị isi niile, na ikike niile na ike niile.
1CO 15:25 Nʼihi na ọ ga-abụ eze tutu ruo mgbe ọ lụgburu ndị iro ya niile, doo ha nʼokpuru ụkwụ ya.
1CO 15:26 Onye iro ikpeazụ a ga-emeri bụ ọnwụ.
1CO 15:27 Nʼihi na “O doola ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Ma mgbe ọbụla asịrị, “e doola ihe niile” nʼokpuru ụkwụ ya, o doro anya na Chineke agụnyeghị onwe ya, nʼihi na ọ bụ ya tinyere ihe niile nʼokpuru Kraịst.
1CO 15:28 Mgbe e merela ka ihe niile nọrọ nʼokpuru ya, mgbe ahụ, Ọkpara ya nʼonwe ya, ga-edobe onwe ya nʼokpuru onye ahụ dobere ihe niile nʼokpuru ya, ka Chineke bụrụ onye na-achị ihe niile.
1CO 15:29 Ma ọ bụghị otu a, gịnị mere ụfọdụ ji eme ndị otu ha baptizim nʼọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụrụ na e meghị ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie ma ọlị, nʼihi gịnị ka a na-eme mmadụ ndị a baptizim nʼọnọdụ ha?
1CO 15:30 Gịnị mere anyị ji nọrọ nʼize ndụ nʼoge awa ọbụla?
1CO 15:31 Nʼịgwa unu eziokwu, ụmụnna m, ana m ezute ọnwụ kwa ụbọchị. Ihe m ji kwupụta nke a bụ nʼihi ịnya isi nke m ji unu anya nʼime Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị.
1CO 15:32 Ọ bụrụ na ndụ anyị na-agwụ nʼụwa a, dịka ndị mmadụ na-ekwu, gịnị bụkwanụ uru m nwere nʼihi ọgụ m na-alụso anụ ọhịa, bụ ndị ikom Efesọs? Ọ bụrụ na a gaghị eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi anyị ga-anwụ.”
1CO 15:33 Unu ekwela ka e duhie unu. Nʼihi na mkparịkọta agwa ọjọọ na-emebi ezi agwa.
1CO 15:34 Sitenụ na ndụ enweghị nghọta unu lọghachita dịka unu kwesiri, unu emehiekwala ọzọ. Nʼihi na-enwere ụfọdụ bụ ndị na-amaghị Chineke. Ana m ekwu nke a ka ihere mee unu.
1CO 15:35 Ma ụfọdụ ga-ajụ, “Olee otu a ga-esi mee ka onye nwụrụ anwụ bilie? Olee ụdị ahụ ha ga-enwe mgbe ha ga-apụta?”
1CO 15:36 Onye nzuzu! Mkpụrụ ọka i tinyere nʼala agaghị epu ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ nwụọ.
1CO 15:37 Mgbe ị na-agha mkpụrụ, ọ bụghị anụ ahụ nke ga-apụta ka ị na-agha, kama ọ bụ naanị mkpụrụ nkịtị, eleghị anya mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ mkpụrụ ọzọ.
1CO 15:38 Ma Chineke na-enye ya ahụ dịka o si chọọ. Ọ na-enyekwa mkpụrụ ọbụla nʼime mkpụrụ niile ahụ nke kwesiri ya.
1CO 15:39 Anụ ahụ niile abụghị otu, mmadụ nwere anụ ahụ dị iche, anụ ọhịa nwere ụdị anụ ahụ nke ha. Anụ ufe nwere anụ ahụ ha, azụ nwekwara nke ha.
1CO 15:40 Ahụ nke eluigwe na ahụ nke ụwa dịkwa. Ma ịma mma na ebube nke ahụ nke eluigwe bụ otu, ịma mma na ebube nke ahụ nke ụwa dịkwa iche.
1CO 15:41 Anyanwụ nwere ebube nke ya, ọnwa nwekwa nke ya, kpakpando nwekwara ebube nke ya. Kpakpando dịkwa iche site nʼibe ya nʼịma mma na ebube.
1CO 15:42 Otu a ka ọ dị nʼebe mbilite nʼọnwụ ndị nwụrụ anwụ dị. Mgbe e liri anụ ahụ anyị, ihe nwụrụ anwụ na nke pụrụ ire ure ka ọ bụ, ma mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ.
1CO 15:43 A na-eli ahụ onye nwụrụ anwụ dịka ihe enweghị ugwu, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼebube. A na-eli onye nwụrụ anwụ nʼadịghị ike, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼịdị ike.
1CO 15:44 A na-eli onye nwụrụ anwụ dịka anụ ahụ nkịtị, ma a na-eme ka o jiri ahụ nke mmụọ kulite. Ọ bụrụ na e nwere anụ ahụ nkịtị, e nwekwara ahụ nke mmụọ.
1CO 15:45 E dere ya, “Mmadụ mbụ, bụ Adam, ghọrọ mkpụrụobi dị ndụ, Adam nke ikpeazụ bụ mmụọ na-enye ndụ.”
1CO 15:46 Ma mmụọ e bughị ụzọ, kama ọ bụ ahụ nkịtị, ma mmụọ bịara nʼikpeazụ.
1CO 15:47 Mmadụ nke nwoke sitere nʼala, ejikwa aja kpụọ ya; mmadụ nke abụọ si nʼeluigwe bịa.
1CO 15:48 Dị ka mmadụ nke mbụ ahụ e jiri aja kpụọ dị, otu a ka ndị niile si nʼaja pụta dịkwa. Ma dị ka mmadụ nke eluigwe ahụ dị, otu a ka ndị niile bụ ụmụ eluigwe dịkwa.
1CO 15:49 Dịka anyị niile yikwasịrị onyinyo nke nwoke e jiri aja kpụọ, otu ahụkwa ka anyị ga-esi yikwasị onyinyo nke nwoke nke eluigwe.
1CO 15:50 Ihe m na-ekwu, ụmụnna m, bụ na anụ ahụ na ọbara enweghị ike iketa alaeze Chineke. Ihe na-ere ure agaghịkwa eketa ereghị ure.
1CO 15:51 Ma geenụ ntị ka m gwa unu ihe omimi a! Ọ bụghị anyị niile na-aga ịnwụ, kama, a ga-enye anyị anụ ahụ ọhụrụ nke pụrụ iche.
1CO 15:52 Nʼotu mgbe, nʼotu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ike ikpeazụ. Nʼihi na opi ga-ada, a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilite na-ereghị ure. A ga-agbanwekwa anyị.
1CO 15:53 Nʼihi na a ghaghị ịgbanwe anụ ahụ anyị a nke na-anwụ anwụ, nyekwa anyị ahụ nke na-agaghị anwụ ọzọ.
1CO 15:54 Mgbe ahụ nke a pụrụ ire ure ga-eyikwasị ereghị ure, nke a pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasị anwụghị anwụ. Mgbe ahụ, okwu ahụ e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ sịrị, “Elomiela ọnwụ, meriekwa ike ya niile.”
1CO 15:55 “Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?”
1CO 15:56 Nʼihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbata mmadụ bụ mmehie, ma ihe na-enye mmehie ike bụ iwu.
1CO 15:57 Ka ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
1CO 15:58 Ya mere, ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya, kwụsienụ ike, bụrụnụ akwaa akwụrụ. Nọgidenụ nʼọrụ Onyenwe anyị mgbe niile, ebe unu maara na ọrụ unu na-arụ nʼime Onyenwe anyị abụghị ihe efu.
1CO 16:1 Nʼihe niile banyere ụtụ ihe onyinye nke ndị nsọ, gbalịanụ mee dịka m nyere ndị chọọchị dị nʼakụkụ Galeshịa nʼiwu.
1CO 16:2 Ụbọchị ụka niile, ka onye ọbụla site nʼihe ọ kpatara nʼizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Unu e cherekwala ịnakọta ihe onyinye ndị a ruo mgbe m ga-abịa. Ka a hapụ iche tutu ruo mgbe m bịara.
1CO 16:3 Mgbe m bịara, aga m edenye ndị ahụ kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị unu họpụtara akwụkwọ nkọwa, ziga ha ibugara ndị nọ na Jerusalem onyinye obiọma unu.
1CO 16:4 Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa na m ga-eso ha gaa, mụ na ha ga-esoro.
1CO 16:5 Aga m abịa ileta unu mgbe m gasịrị Masidonia. Nʼihi na ana m ezube isi nʼụzọ Masidonia abịa.
1CO 16:6 Mgbe m bịara, ọ na-adị m ka mụ na unu ga-anọ ogologo oge. Ma eleghị anya, anyị ga-anọ tutu oge oyi agwụ. Mgbe ahụ site, nʼinyeaka unu, aga m ahapụ unu gaa ebe ọzọ.
1CO 16:7 Nʼihi na-achọghị m ileta unu ugbu a m nọ nʼije ngafere. Kama ana m ezube ịbịa nọnyere unu nwa oge, ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị e kwenye.
1CO 16:8 Ma aga m anọ nʼEfesọs tutu ruo oge Pentikọọsụ,
1CO 16:9 nʼihi na-emegheela ọnụ ụzọ dị ukwuu nke na-arụpụta ezi ọrụ nye m, ma ha dị ọtụtụ bụ ndị na-eguzogide m.
1CO 16:10 Ọ bụrụ na Timoti abịa, lezienụ anya mee ka ọ ghara inwe ihe ọ ga-atụ egwu mgbe ọ nọ nʼetiti unu, nʼihi na ọ bụ onye na-arụ ọrụ Onyenwe anyị dịka m si arụ ya.
1CO 16:11 Ka onye ọbụla ghara ileda ya anya. Kama, dupunụ ya nʼije ya nʼudo ka o nwe ike lọghachikwute m. Mụ na ụmụnna ndị ọzọ na-ele anya nlọta ya.
1CO 16:12 Arịrịọ m nwanne anyị Apọlọs ka o soro ụmụnna ndị ọzọ bịa leta unu, ma ọ bụghị uche ya ma ọlị ịbịakwute unu ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe ọbụla ohere pụtara.
1CO 16:13 Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike.
1CO 16:14 Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọbụla unu na-arụ.
1CO 16:15 Ugbu a, arịọ m unu ụmụnna m, unu maara na ezinaụlọ Stefanas bụ ndị mbụ kwere ekwe nʼala Akaịa. Ha nyekwara onwe ha maka ijere ndị nsọ ozi.
1CO 16:16 Ana m arịọ unu ka unu na-asọpụrụ ndị dị otu a, nakwa onye ọbụla bụ onye otu anyị na onye ọrụ anyị.
1CO 16:17 Obi tọrọ m ụtọ nʼọbịbịa nke Stefanas na Fọtunetus na Akaikọs. Ha emelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nʼebe a.
1CO 16:18 Ha kwalitere mmụọ m dịka ha kwalitere nke unu. Nyenụ ndị dị otu a nsọpụrụ.
1CO 16:19 Ụlọ chọọchị niile dị nʼokpuru Eshịa na-ezitere unu ozi ekele. Akwila na Prisila, na nzukọ dị nʼụlọ ha na-enye unu ekele obiọma nʼime Onyenwe anyị.
1CO 16:20 Ụmụnna niile nọ nʼebe a na-ekele unu. Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu.
1CO 16:21 Ọ bụ mụ onwe m bụ Pọl ji aka m na-ede ekele nke a.
1CO 16:22 Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụghị Onyenwe anyị nʼanya, ka ọ bụrụ onye a bụrụ ọnụ. Onyenwe anyị bịa!
1CO 16:23 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu.
1CO 16:24 Ka ịhụnanya m dịnyere unu niile site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. Amen.
2CO 1:1 Pọl, onyeozi nke Jisọs Kraịst dịka ọchịchọ nke Chineke si dị, na Timoti nwanne anyị nwoke, Na-edegara chọọchị Chineke nke dị na Kọrint, na ndị nsọ niile ndị nọ nʼala Akaịa akwụkwọ:
2CO 1:2 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
2CO 1:3 Otuto dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasiobi niile.
2CO 1:4 Onye na-akasị anyị obi nʼime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʼụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi. Inyere ha aka dịka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nʼaka Chineke.
2CO 1:5 Nʼihi na dịka anyị si eketa oke nʼime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a nkasiobi anyị na-ababiga ụba site na Kraịst.
2CO 1:6 Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nʼihi na nkasiobi unu, nakwa nzọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, ọ bụkwa nʼihi nkasiobi unu, nke na-arụpụta ike na ume iji ntachiobi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa.
2CO 1:7 Olileanya anyị nwere nʼebe unu nọ sịrị ike, ebe anyị maara na dịka unu si eketa oke nʼịta ahụhụ anyị, otu ahụkwa ka unu ga-esi keta oke na nkasiobi ahụ anyị na-anata.
2CO 1:8 Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nʼEshịa. Nʼezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesi dịrị ndụ.
2CO 1:9 Nʼezie, ọ dị nnọọ nʼoge ahụ, dịka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesighị ka anyị tụkwasị obi nʼike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nʼime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie.
2CO 1:10 Ọ bụ Chineke bụ onye zọpụtara anyị site nʼime oke ọnwụ dị otu a. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nʼihu na-azọpụtakwa anyị,
2CO 1:11 dịka unu ga-enyekwara anyị aka site nʼekpere unu, ka ọtụtụ nwere ike nye ekele nʼihi anyị maka onyinye amara anyị natara na nzaghachi ekpere ọtụtụ mmadụ ndị a na-ekpere anyị.
2CO 1:12 Ịnya isi anyị bụ nke a, na akọnuche anyị na-agbara anyị akaebe na anyị kpara agwa ọma nʼụwa, karịchasịa nʼebe unu nọ, nʼịdị nsọ na izi ezi nke si nʼaka Chineke. Nke a bụ site nʼamara o nyere anyị, ọ bụghị site nʼamamihe nke mmadụ.
2CO 1:13 Nʼihi na ihe anyị na-edere unu abụghị ihe unu na agaghị agụta maọbụ ghọta. Enwere m nchekwube na unu ga-aghọta ya nke ọma.
2CO 1:14 Dịka unu ghọtarala anyị nwa nke nta ugbu a, unu ga-eji anyị anya isi nʼụbọchị nke Onyenwe anyị Jisọs.
2CO 1:15 Ihe m na-ekwu were m anya, nke mere m ji chọọ ibu ụzọ bịa leta unu ka unu nwee uru abụọ.
2CO 1:16 Ebu m ya nʼobi na m ga-akwụsị hụ unu mgbe m na-agafe ịga Masidonia. Ebukwa m ya nʼobi m na mgbe m si Masidonia na-alaghachi na m ga-akwụsịkwa ileta unu, ka unu nweekwa ike inyere anyị aka mgbe anyị bidoro ịlaghachi Judịa.
2CO 1:17 E nwere m obi abụọ mgbe m chọrọ ime nke a? Ana m ezube nzube m dịka mmadụ nkịtị, onye dị nkwadobe ikwu “E,” na “E e,” nʼotu oge ahụ?
2CO 1:18 Ma dịka Chineke si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi, okwu anyị gwara unu abụghị “E,” na “E e.”
2CO 1:19 Nʼihi na Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼọnụ Saịlas na Timoti na mụ onwe m kwusaa abụghị “E” na “E e,” kama nʼime ya ọ bụ naanị “E.”
2CO 1:20 Nʼime Kraịst ka anyị hụrụ “E” na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee “Amen” nʼinye Chineke otuto.
2CO 1:21 Ọ bụ Chineke nʼonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nʼime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e tere mmanụ.
2CO 1:22 Ọ kara anyị akara nʼihu, nyekwa anyị Mmụọ Nsọ ya ka o biri nʼobi anyị, dịka onye ga-ahụ na anyị ga-emezu nkwa ahụ niile.
2CO 1:23 Ana m akpọku Chineke dịka onye akaebe m, ọ bụ nʼihi ịnapụta unu mere m ji hapụ ịbịa Kọrint.
2CO 1:24 Ọ bụghị na anyị bụ ndị ọchịchị nke okwukwe unu, kama anyị so unu na-arụkọ ọrụ ka unu nwe ọṅụ nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka unu ga-esi kwụrụ chịm.
2CO 2:1 Ekpebiri m nʼime obi m na-agaghị m abịakwute unu ọzọ, iwetara unu ihe mwute.
2CO 2:2 Nʼihi na ọ bụrụ na m eme ka obi jọọ unu njọ, onye kwanụ ga-akasị m obi ma ọ bụghị unu, unu onwe unu ndị m mere ka obi jọọ njọ?
2CO 2:3 E deere unu akwụkwọ a dịka m kwesiri ime ka m ghara inwe mwute mgbe m bịara, site nʼaka ndị kwesiri ime ka obi dị m mma, nʼihi na o doro m anya na ọṅụ m ga-abụ ọṅụ nke unu niile.
2CO 2:4 Eji m anya mmiri dị ukwuu na oke obi mgbu na obi mgbawa deere unu akwụkwọ, ọ bụghị ka m kpasuo unu iwe kama ka unu nwee ike ịmata oke ịhụnanya m nwere nʼebe unu nọ.
2CO 2:5 Ọ bụrụ na onye ọbụla mere ihe butere obi mgbu, ka a hapụ ikwu ya karịa ka o kwesiri, ọ bụghị naanị m ka o wetaara obi mgbu, o wetakwaara unu niile obi mgbu.
2CO 2:6 Nʼihi na ntaramahụhụ unu niile kpebiri nye ya ezuola.
2CO 2:7 Ugbu a, bikonu ụmụnna m, o kwesiri ka unu gbaghara ya, ma kasịe ya obi, ka ọ hapụ inwe obi ilu maọbụ daa mba na mmụọ ya, rubiga ụjụ oke.
2CO 2:8 Ya mere ana m arịọ unu, bikonu, gosinụ ya na unu hụrụ ya nnọọ nʼanya.
2CO 2:9 Ihe mere m ji dee ihe m dere nʼakwụkwọ nke mbụ bụ ka m chọpụta ma unu jikekwara mgbe niile irube isi nʼihe niile.
2CO 2:10 Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ahụ mụ onwe m kwa agbagharala ya. Mgbaghara m, a sịkwa na o nwere ihe m na-agbaghara, ana m eme ya nʼihi unu nʼihu Kraịst.
2CO 2:11 Anyị na-eme nke a ka Ekwensu ghara ịghọgbu anyị. Anyị maara ihe niile ọ na-ezube.
2CO 2:12 Mgbe m bịarutere Troas ikwusa oziọma Kraịst, e megheere m ụzọ nʼime Onyenwe anyị.
2CO 2:13 Ma enweghị m izuike nʼime obi m, nʼihi na ahụghị m Taịtọs ezi nwanna m nʼebe ahụ. Nke a mere m jiri kelee ha hapụ ha gawa Masidonia.
2CO 2:14 Ma ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị na-enye anyị mmeri, nʼihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst, onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọbụla nụrụ isisi ụtọ nke oziọma ya.
2CO 2:15 Nʼihi na anyị bụ mmanụ isi ụtọ nke Kraịst nye Chineke, nʼetiti ndị ọ na-azọpụta na nʼetiti ndị na-ala nʼiyi.
2CO 2:16 Nʼetiti ndị ahụ na-ala nʼiyi, isisi ụtọ a bụ ihe na-ewetara ha ọnwụ, ma nʼetiti ndị ahụ a na-azọpụta, ọ bụ isisi ụtọ a na-ewetara ha ndụ. Onye zuru ime ihe ndị a?
2CO 2:17 Nʼihi na anyị adịghị ka ọtụtụ mmadụ ndị na-eji okwu Chineke azụ ahịa. Kama, nʼime Kraịst anyị na-ekwu okwu anyị site nʼobi dị ọcha, dịka ndị ahụ Chineke zipụrụ ịrụ ọrụ a.
2CO 3:1 Anyị na-ebido ito onwe anyị ọzọ? Ọ dị a mkpa anyị inye unu, maọbụ ịnata nʼaka unu akwụkwọ nkọwa iji too onwe anyị dịka ụfọdụ mmadụ ndị ọzọ si eme?
2CO 3:2 Unu onwe unu bụ akwụkwọ ozi anyị nke e dere nʼobi anyị nke mmadụ niile maara ma gụọkwa.
2CO 3:3 Unu na-egosikwa na unu bụ akwụkwọ ozi si nʼebe Kraịst nọ, mpụta ihe nke ozi anyị jere. Ọ bụghị ihe e ji inki dee na mbadamba nkume, kama ọ bụ mmụọ Chineke na-adị ndụ ka e ji dee ya na mbadamba obi mmadụ.
2CO 3:4 Nke a bụ ntụkwasị obi anyị nwere site na Kraịst nʼebe Chineke nọ.
2CO 3:5 Ọ dịkwaghị mgbe anyị ji chee nʼime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọbụla bara uru site nʼike aka anyị, kama ihe ọbụla anyị nwere, ihe ọbụla anyị rụpụtara, sitere nʼaka Chineke.
2CO 3:6 Onye mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke edeghị nʼakwụkwọ iwu kama nʼime Mmụọ. Ihe e dere nʼakwụkwọ iwu na-eweta ọnwụ, ma Mmụọ na-enye ha ndụ.
2CO 3:7 Ma ọ bụrụ nʼije ozi ahụ nke na-eweta ọnwụ bụ nke e gbunyere nʼelu nkume ji ebube dị ukwuu bịa, nke mere na ụmụ Izrel apụghị ilegide Mosis anya nʼihu mgbe o si nʼelu ugwu Saịnaị rịdata nʼihi ebube nke ihu ya, bụ ebube nke na-agabiga agabiga,
2CO 3:8 ọ bụ nʼije ozi nke Mmụọ nsọ agaghị adị ebube karịa?
2CO 3:9 Ọ bụrụ na-enwere ebube nʼime ije ozi nke amamikpe, ije ozi nke ezi omume ga-adị ebube karịa ya.
2CO 3:10 Nʼezie, ihe jupụtara nʼebube mgbe ochie enwekwaghị ebube ọbụla ugbu a, nʼihi na ebube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ekpuchiela ya.
2CO 3:11 Ọ bụrụ na ihe na-agafe agafe nwere ebube dị otu a, ihe ga-anọgide mgbe niile ga-enwe ebube karịa ya.
2CO 3:12 Ya mere, ebe ọ bụ na anyị nwere olileanya dị otu a, anyị enweghị egwu ọbụla.
2CO 3:13 Anyị agaghị adị ka Mosis onye weere akwa kpuchie ihu ya, nʼihi na ọ chọghị ka ụmụ Izrel hụ ebube ahụ na-agbanwe agbanwe.
2CO 3:14 Kama e mechiri obi ha ruo taa. Nʼihi na mgbe ọbụla ha gụrụ akwụkwọ ọgbụgba ndụ ochie ahụ, akwa mkpuchi ahụ na-anọgidekwa apụghị apụ nʼobi ha, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼime Kraịst ka ọ ga-eji pụọ.
2CO 3:15 Ee, tutu ruo taa, mgbe ọbụla ha na-agụ akwụkwọ iwu ahụ Mosis dere, ihe mkpuchi na-adịgide nʼobi ha.
2CO 3:16 Ma mgbe onye ọbụla tụgharịrị nʼebe Onyenwe anyị nọ, a na-ewepụ akwa mkpuchi ahụ.
2CO 3:17 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ, ma ebe ọbụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nʼebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya.
2CO 3:18 Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi site nʼihu, na-egosi ebube nke Onyenwe anyị. A na-agbanwe anyị ịbanye nʼoyiyi ya site nʼebube ruo nʼebube, nke si nʼaka Onyenwe anyị, onye bụ Mmụọ.
2CO 4:1 Ya mere, ebe anyị natara ije ozi a site nʼebere Chineke, ike adịghị agwụ anyị nʼobi.
2CO 4:2 Anyị ahapụla omume nzuzo niile na-eweta ihere. Anyị ahapụla ụzọ aghụghọ niile, maọbụ iji okwu Chineke na-atụ asị. Kama site nʼikwupụta eziokwu ahụ ka ndị mmadụ were ezi akọnuche ha mata ụdị mmadụ anyị bụ nʼihu Chineke.
2CO 4:3 Ma a sịkwa na oziọma nke anyị na-ekwusa dịka ihe e zoro ezo, ọ bụ ihe e zoro ezo nye ndị ahụ na-ala nʼiyi.
2CO 4:4 Nʼebe ha nọ, chi nke ụwa a ekpuchiela uche ndị na-ekweghị ekwe iji gbochie ha ịhụ ìhè nke oziọma ahụ na-ezipụta ebube Kraịst, onye dị nʼụdị Chineke nʼonwe ya.
2CO 4:5 Nʼihi na ọ bụghị anyị onwe anyị ka anyị na-ekwusa, kama anyị na-ekwusa na Kraịst Jisọs bụ Onyenwe anyị. Ma anyị onwe anyị bụ ụmụodibo unu nʼihi Jisọs.
2CO 4:6 Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst.
2CO 4:7 Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke dị oke ọnụahịa dị nʼime ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si nʼaka Chineke, ọ bụghị nʼaka anyị.
2CO 4:8 A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba.
2CO 4:9 A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi.
2CO 4:10 Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị.
2CO 4:11 Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ.
2CO 4:12 Nke a pụtara na ọnwụ na-arụsị ọrụ ike nʼime anyị, ma na ndụ na-arụ ọrụ nʼime unu.
2CO 4:13 Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dịka e si dee nʼakwụkwọ nsọ, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo.” Anyị onwe anyị kwekwara, nʼihi nke a mere anyị ji na-ekwu,
2CO 4:14 ma anyị maara na onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nʼọnwụ bilie, ma kpọbatakwa anyị na unu nʼihu ya.
2CO 4:15 Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke.
2CO 4:16 Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.
2CO 4:17 Nwantịntị ahụhụ nke anyị na-ata ugbu a, nke na-adị nwa oge, na-akwadoro anyị otuto ebighị ebi dị ukwuu.
2CO 4:18 Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
2CO 5:1 Nʼihi na anyị ma nke ọma na mgbe e mebiri ụlọ ikwu nke anyị bi nʼime ya, bụ ụlọ nke ụwa a, anyị nwere ụlọ nke sitere na Chineke, ụlọ nke ejighị aka wuo, ga-adị ebighị ebi nʼeluigwe.
2CO 5:2 Ugbu a anyị nọ na-asụ ude, na-enwe agụụ inweta ebe obibi anyị dị nʼeluigwe.
2CO 5:3 Ka ọ ga-abụ anyị yiri ya, ka anyị hapụ ịdị ka ndị gba ọtọ.
2CO 5:4 Mgbe ahụ niile anyị nọ nʼime ụlọ ikwu a, anyị na-anọgide nʼịsụ ude nke ibu arọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị chọrọ ịnwụ anwụ bụrụ ndị na-enweghị anụ ahụ, kama ọ bụ nʼihi na anyị chọrọ ka e yikwasị anyị anụ ahụ nke eluigwe ahụ, ka anụ ahụ a pụrụ ịnwụ anwụ yikwasị ndụ ebighị ebi.
2CO 5:5 Chineke onye ya onwe ya, bụ onye kwadobere anyị maka mgbanwo nke a, nyekwara anyị Mmụọ Nsọ ka ọ bụrụ onye ga-ahụ na anyị ga-enwetazu nkwa ahụ niile.
2CO 5:6 Nʼihi nke a, anyị nwere obi ike mgbe niile, nʼihi na anyị maara na mgbe anyị na-aga nʼihu na-adị ndụ nʼanụ ahụ a, anyị na Onyenwe anyị anọghị.
2CO 5:7 Nʼihi ọ bụ okwukwe ka anyị ji adị ndụ ọ bụghị ihe anya hụrụ.
2CO 5:8 Obi siri anyị ike. Ọ gaara amasị anyị ịhapụ ụlọ nke a anyị bi na ya, bụ ahụ anyị ma lakwuru Onyenwe anyị nʼebe obibi ya.
2CO 5:9 Ya mere, ma anyị nọ nʼụlọ a maọbụ nʼọzọ, ihe anyị chọrọ bụ ka anyị mee ihe ga-atọ ya ụtọ.
2CO 5:10 Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ.
2CO 5:11 Ọ bụ nʼihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ka ndị mmadụ mata Chineke makwaara ụdị mmadụ anyị bụ. Enwekwara m olileanya na nke a pụtara ihe nye akọnuche unu.
2CO 5:12 Anyị adịghị agbalị ịgwa unu na anyị dị mma, kama anyị chọrọ inye unu ihe unu ga-eji nyaa isi mgbe unu na-ekwu ihe banyere anyị, ka unu nwee ike ịmata ihe unu ga-azaghachi ndị ahụ na-anya isi banyere ihe ha ji anya ha hụ, kama ihe dị mmadụ nʼobi.
2CO 5:13 Ọ bụrụ na anyị amaghị onwe anyị, ọ bụ nʼihi Chineke, ọ bụrụ na anyị nwere uche zuruoke, ọ bụ nʼihi unu.
2CO 5:14 Ọ bụ ịhụnanya Kraịst na-akwagide anyị, nʼihi na anyị kwere na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile, nke pụtara na mmadụ niile anwụọla.
2CO 5:15 Ọ nwụrụ nʼihi mmadụ niile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama maka onye ahụ nwụrụ nʼihi ha ma sikwa nʼọnwụ kulie.
2CO 5:16 Bido ugbu a gawa, anyị adịghị elekwa onye ọbụla anya dịka mmadụ nkịtị. Nʼihi na anyị sitere nʼụzọ dị otu a lee Kraịst anya, chee na ọ bụ mmadụ efu. Ma ugbu a, anyị amakwaghị ya nʼụzọ dị otu a.
2CO 5:17 Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie.
2CO 5:18 Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nʼaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nʼudo. Ma ugbu a, o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nʼudo.
2CO 5:19 Ihe nke a pụtara bụ na Chineke sitere na Kraịst na-eme ka ya na ụwa dị na mma. Ọ dịghị agụkọrọ ụmụ mmadụ mmehie niile, kama o tinyela nʼaka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ.
2CO 5:20 Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nʼụwa. Chineke ji anyị na-agwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dịka ọ bụ Kraịst nʼonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke dịrị nʼudo.
2CO 5:21 Nʼihi na o mere ka onye ahụ na-amaghị mmehie bụrụ mmehie nʼọnọdụ anyị, ka esi otu a mee ka anyị nwee oke nʼime ezi omume Chineke site na ya.
2CO 6:1 Dịka ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ nʼotu, anyị na-arịọ arịrịọ sị unu ahapụla ịnara amara a Chineke na-enye unu nʼefu.
2CO 6:2 Nʼihi na ọ na-ekwu, “Nʼoge m na-anara mmadụ nke ọma anụrụ m olu unu. Ọ bụkwa ụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.” Lee, ugbu a bụ oge a na-anabata mmadụ nke ọma, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.
2CO 6:3 Anyị etinyeghị ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ onye ọbụla ka ọ ghara iwetara ọrụ anyị ihe ịta ụta.
2CO 6:4 Kama nʼime ihe niile, anyị na-agbalịsị ike ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ ndị na-ejere Chineke ozi. Anyị ji ndidi na ntachiobi na-edi nsogbu niile na mkpagbu niile na ahụhụ niile na-adakwasị anyị.
2CO 6:5 A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nʼime ịmụ anya na-erighị nri,
2CO 6:6 nʼime ịdị ọcha na ezi nghọta na ntachiobi nke anyị nwere, nʼinwe obiọma na ezi ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị na ya nʼime Mmụọ Nsọ,
2CO 6:7 sitekwa nʼikwu eziokwu na site nʼike Chineke. Anyị buru ezi omume dịka ngwa agha nʼaka nri na nʼaka ekpe.
2CO 6:8 Ụfọdụ na-asọpụrụ anyị ma ndị ọzọ na-eme anyị ihe ihere. Ụfọdụ na-ata anyị ụta, ma ụfọdụ na-eto anyị. Ụfọdụ mmadụ na-agụ anyị dị ka ndị ụgha, ma anyị nọgidesịrị ike na-ekwu eziokwu.
2CO 6:9 Ụwa amaghị anyị, ma a maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe niile, ma lee anyị ka dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee anyị anwụghị.
2CO 6:10 Anyị na-anọ nʼihe mwute mgbe niile, ma lee ọṅụ juru anyị obi. Anyị bụ ndị ogbenye, ma anyị na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ọgaranya. Anyị enweghị ihe ọbụla, ma lee anyị nwere ihe niile.
2CO 6:11 Ndị enyi anyị nọ na Kọrint, anyị agwala unu ihe niile dị anyị nʼobi, anyị emeghepụla obi anyị nye unu.
2CO 6:12 Anyị ji obi anyị niile hụ unu nʼanya, ma unu mechiri obi unu nʼebe anyị nọ.
2CO 6:13 Ugbu a, ana m ekwu dịka ana m agwa ụmụntakịrị. Na-emesonu anyị dịka anyị si emeso unu, meenụ ka obi unu saa mbara nʼebe anyị nọ.
2CO 6:14 Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ?
2CO 6:15 Ọ bụ nwekọ dị aṅaa dị na-agbata Kraịst na ekwensu? Gịnịkwa ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ?
2CO 6:16 Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru, “M ga-ebi nʼime ha. Jegharịakwa nʼime ha. M ga-abụkwa Chineke ha, ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”
2CO 6:17 Ya mere, “Sinụ nʼetiti ha pụta. Nọpụkwanụ iche nʼebe ha nọ. Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka. Mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.”
2CO 6:18 Ma, “Aga m abụrụ unu Nna, unu onwe unu ga-abụkwara m ụmụ m ndị ikom na ndị inyom. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.”
2CO 7:1 Ya mere, ndị enyi m, ebe anyị nwere nkwa ndị a niile, ka anyị debe onwe anyị ọcha nʼime ihe niile ọbụla nke na-emerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Ka anyị mezuo ịdị nsọ nʼịtụ egwu Chineke.
2CO 7:2 Megheenụ obi unu nabata anyị, nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼetiti unu anyị mere ihe ọjọọ. O nwekwaghị onye anyị duhiere. Ọ dịkwaghị onye ọbụla anyị rigburu.
2CO 7:3 Anaghị m ekwu ihe ndị a ka m maa unu ikpe, dịka m kwuburu na mbụ, na anyị bu unu nʼobi anyị, ịdịkọ ndụ, maọbụ ịnwụkọkwa ọnwụ nʼotu.
2CO 7:4 Nkwuwa okwu m ji gwa unu okwu dị ukwuu; ịnya isi m nʼihi unu dịkwa ukwuu. Abụ m onye a gbara ume nʼebe ọ dị ukwu, nʼime ọnọdụ ahụhụ anyị niile, ana m aṅụrịbiga ọṅụ oke.
2CO 7:5 Nʼihi na mgbe anyị batara Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nʼaka nri na aka ekpe bịakwute anyị, ọgụ nʼezi, egwu nʼime.
2CO 7:6 Ma otu ọ dị, Chineke, onye na-agba ndị ike gwụrụ ume, gbara anyị ume site nʼọbịbịa Taịtọs.
2CO 7:7 Ọ bụkwaghị naanị nʼihi na ọbịbịa ọ bịara nyere anyị obi ụtọ, kama akụkọ o ji bịa, gbasara otu unu si gbaa ya ume, gwakwa anyị otu unu si na-ele anya ịhụ m, na otu unu si na-eru ụjụ nʼihi ihe niile mere, na otu unu si guzosie ike nʼukwu m, na ụdị ịhụnanya unu nwere nʼebe m nọ, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
2CO 7:8 Ọ naghị ewutekwa m ugbu a na m deere unu akwụkwọ ahụ, ọ bụ ezie na o wutere m mgbe ahụ m na-ede ya, nʼihi na amaara m na ọ ga-ewetara unu obi ọjọọ mgbe unu gụrụ ya. Ma obi ọjọọ ahụ abụrụla naanị nke nwa oge nta.
2CO 7:9 Ma ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ na m dere akwụkwọ ahụ. Ọ bụghị nʼihi na ọgụgụ ya wetaara unu obi ọjọọ, kama ọ bụ nʼihi na mwute o wutere unu emeela ka unu chegharịa. Ụdị mwute unu nwere bụ ụdị mwute Chineke chọrọ ka ndị nke ya nwee. Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị unu nʼihi akwụkwọ anyị deere unu.
2CO 7:10 Nʼihi na iru ụjụ otu Chineke chọrọ na-eweta nchegharị nke na-eduba mmadụ na nzọpụta, bụ nchegharị nke a na-apụghị ịkwa ụta banyere ya. Ma iru ụjụ dịka ụwa si eme na-eweta ọnwụ.
2CO 7:11 Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nʼihe mwute dakwasịrị unu. Ugbu a, unu abụrụla ndị ọ na-anụ ọkụ nʼobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwanụ otu unu si mee ihe niile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nʼokwu ndị a niile.
2CO 7:12 Ọ bụ ezie na m deere unu akwụkwọ ahụ, ma edeghị m ya nʼihi onye ahụ mehiere, maọbụ nʼihi onye ahụ e mehiere megide. Kama edere m ya ime ka Chineke gosi unu otu ihe gbasara anyị si na-anụ unu ọkụ nʼobi.
2CO 7:13 Nʼụzọ niile ndị a, anyị bụ ndị a gbara ume site nʼịhụnanya unu nwere nʼebe anyị nọ. A gbara anyị ume karịa site na ịhụ ọṅụ Taịtọs nʼihi nnabata unu nabatara, na otu unu si mee ka mmụọ ya zuru ike mgbe ọ bịakwutere unu.
2CO 7:14 Nʼihi na tupu ọ hapụ anyị bịakwute unu, anyara m isi nʼihu ya banyere unu; ugbu a, obi dị m ụtọ nke ukwuu nʼihi na unu emeghị ka ihere mee m. Anyị ekwuola eziokwu nye unu. Ugbu a, ịnya isi m nʼebe Taịtọs nọ egosila na anyị bụ ndị eziokwu.
2CO 7:15 Ugbu a, ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ na-aba ụba nke ukwuu, nʼihi ncheta ọ na-echeta otu unu niile si jiri ọṅụ gee ya ntị na otu unu si jiri ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji nabata ya.
2CO 7:16 Nke a na-enyekwa m obi ụtọ nʼihi na enwere m ntụkwasị obi nʼebe unu nọ nʼime ihe niile.
2CO 8:1 Anyị chọrọ ime ka unu mara, ụmụnna m, ihe banyere ihe nke amara Chineke rụrụ na nzukọ niile dị na Masidonia.
2CO 8:2 Nʼime ọnọdụ oke mkpagbu na ihe mwute, ha nwere ọṅụ dị nnọọ ukwuu ruo na ha gbasara aka ha nye ndị ọzọ ihe, wezugakwa na ọ bụ ezie na ha bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ.
2CO 8:3 Ana m agba ama na ha nyere dịka ike ha, ha nyekwara ọ bụladị karịa otu a tụrụ anya. Onyinye ha si nʼobi ha pụta.
2CO 8:4 Nʼezie, ha rịọsiri anyị arịrịọ ike ka anyị nara onyinye amara ha nyere nʼihi iso keta oke inyere ndị nsọ ndị ọzọ nọ na mkpa aka.
2CO 8:5 Nke ka nke, ha nyere karịa ihe anyị lere anya na ha ga-enye. Nʼihi na ha buru ụzọ were onwe ha nye Onyenwe anyị. Ha sitekwara nʼọchịchọ Chineke nyekwa anyị onwe ha.
2CO 8:6 Ya mere, anyị rịọrọ Taịtọs, onye malitere ọrụ ka ọ rụzuo ọrụ amara ahụ ruo nʼisi.
2CO 8:7 Ma ebe unu babigara ụba oke nʼihe niile unu nwere, nʼokwukwe, na okwu, nʼihe ọmụma, na ịnụ ọkụ nʼobi, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezie unu anya hụ na unu babigakwara ụba oke nʼamara nke inye ihe a.
2CO 8:8 Anaghị m enye unu iwu, kama site nʼizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nʼobi inyeaka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nʼobi unu ọ ga-adakọtakwa.
2CO 8:9 Nʼihi na unu maara ụdị amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nʼihi unu, ka unu onwe unu site nʼogbenye ya bụrụ ọgaranya.
2CO 8:10 Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu nʼokwu a. Ọ baara unu uru ka unu rụzuo ọrụ unu malitere ịrụ nʼafọ gara aga. Unu bụ ndị mbụ buru ụzọ chepụta ịrụ ọrụ a, unu bụkwa ndị mbụ buru ụzọ malite ime ihe banyere ya.
2CO 8:11 Ma ugbu a mezuonụ ihe unu chepụtara ime. Ka ịnụ ọkụ nʼobi unu nwere na mbụ ịrụ ọrụ a bụrụkwa ihe unu ga-eji mezuo ya dịka ihe unu nwere si dị.
2CO 8:12 Nʼihi na ọ bụrụ na ịnụ ọkụ nʼobi dị ebe ahụ, a na-anara ya dịka ihe mmadụ nwere ike inye, ọ bụghị ihe ọ na-enweghị ike inye.
2CO 8:13 Nzube m abụghị ka unu nye nʼụzọ ihe ga-esi siere unu ike nʼihi na unu nyere. Kama ka e nwe nhatanha.
2CO 8:14 Ugbu a, ọ bụ ihe dị mma ka unu nyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. Mgbe unu ga-anọkwa na mkpa, ha ga-enyere unu aka ma ha nwee hie nne. Nʼụzọ dị otu a, a ga-enwe nhatanha.
2CO 8:15 Nke a bụkwa ihe akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ahụ chịkọtara hie nne enweghị karịa. Onye nke chịkọtara ihe dị nta enweghị ihe fọdụrụ ya inweta ihe ọ chọrọ.”
2CO 8:16 Ekelere m Chineke onye tinyere nʼobi Taịtọs otu ịnụ ọkụ ahụ banyere unu ekele, dịka o si emetụ m nʼobi.
2CO 8:17 Ọ bụghị naanị na o kweere ime dịka anyị si rịọrọ ya, kama nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ, o kpebiri nʼime obi ya ịbịakwute unu na inyere unu aka.
2CO 8:18 Anyị na-ezitekwa ya na nwanna anyị onye ahụ nzukọ niile na-asọpụrụ nʼihi ọrụ ikwusa oziọma ahụ.
2CO 8:19 Ma ọ bụghị naanị nke a, kama nzukọ họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka dịka anyị na-ebu onyinye a, bụ ije ozi anyị na-eje nʼihi iwetara Onyenwe anyị otuto, na izipụta njikere anyị inyere ibe anyị aka.
2CO 8:20 Anyị na-eze ka onye ọbụla ghara ịta anyị ụta nʼihe ọbụla, nʼihi ụzọ anyị si jee ozi gbasara onyinye mgbasapụ aka a.
2CO 8:21 Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị naanị nʼihu Onyenwe anyị, kama nʼihu ndị mmadụ kwa.
2CO 8:22 Ugbu a anyị na-ezitekwara unu nwanna anyị nwoke ọzọ ka o soro ha bịakwute unu, nwanna anyị a bụ onye anyị nwapụtara, onye ọ na-anụ ọkụ nʼobi inyeaka. Ugbu a, o nwekwara ntụkwasị obi dị ukwuu nʼebe unu nọ.
2CO 8:23 Ma banyere Taịtọs, ọ bụ onye otu m nʼọrụ a, bụrụkwa onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ nʼetiti unu. Ma banyere ụmụnna anyị ndị ọzọ a, ha bụ ndị na-anọchite anya nzukọ, na ndị na-ewetara Kraịst otuto.
2CO 8:24 Ya mere, gosinụ ha ihe ga-eme ka ha mata na unu hụrụ ha nʼanya. Meekwanụ ka ha mata ihe bụ ịnya isi anyị banyere unu, ka chọọchị niile hụkwa ya.
2CO 9:1 Ọ dịghị mkpa idere unu akwụkwọ banyere ozi nke ndị nsọ.
2CO 9:2 Amaara m na unu jikeere inyere ha aka, dịka m nyara isi nye ndị Masidonia banyere unu. Nʼihi na agwara m ha na unu ndị bi na Akaịa ejikerelarị inyere ha aka kemgbe afọ gara aga. Ọ bụkwa ịnụ ọkụ nʼobi unu kwaliri obi ha, ime ihe ha mere.
2CO 9:3 Ugbu a, ana m ezitere unu ụmụnna anyị ndị a ka e mee ka ịnya isi nke m nyara banyere unu ghara ịbụ okwu efu. Ma dịka m gwara ha na unu ejikerela, achọrọ m ka unu jikere nye ha ihe unu chọrọ inye.
2CO 9:4 Nʼihi na ọ bụrụ na ndị Masidonia esoro m bịa hụ na unu ejikeghị ejike, ebe anyị na-anya isi na unu ejikerela, ọ ga-abụrụ m ihe ihere, bụkwara unu ihe ihere, ebe anyị nwere ntụkwasị obi na unu ga-anọ na njikere.
2CO 9:5 Ọ bụ nke a mere m ji hụ na ọ dị mkpa ịrịọ ụmụnna anyị ka ha buru ụzọ bịa, tupu m bịa. Ka unu nwee ike ịkwado onyinye ahụ unu kwere na nkwa inye, jide ya na njikere ruo mgbe m bịara. Ka unu si otu a gosi ndị mụ na ha ga-eso na unu na-enye nʼihi na unu chọrọ inye, ọ bụkwaghị nʼihi na a gwara unu ka unu nye.
2CO 9:6 Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne.
2CO 9:7 Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya.
2CO 9:8 Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma.
2CO 9:9 Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.”
2CO 9:10 Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ọ ga-eri, ọ ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba.
2CO 9:11 Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.
2CO 9:12 Nʼihi na ije ozi nke ife ofufe a abụghị naanị nke igboro ndị nsọ mkpa ha, kama ọ bụkwa nke na-eme ka ekele ọtụtụ ndị mmadụ na-enye Chineke babiga ụba oke.
2CO 9:13 Nʼihi ije ozi a, nke unu sitere na ya gosi onwe unu dịka ndị kwesiri, ndị ọzọ ga-eto Chineke nʼihi irube isi unu nke dakọtara na nkwupụta unu banyere oziọma nke Kraịst, ya na onyinye afọ ofufu nke unu na-eme ka ha na ndị ọzọ niile soro unu nwekọ.
2CO 9:14 Nke a ga-eme nʼekpere ha maka unu, ha ga-eji obi ha niile rịọọ arịrịọ, nʼihi ịdị ukwu nke amara Chineke dị nʼime unu.
2CO 9:15 Ekele dịrị Chineke nʼihi onyinye ya dị ukwuu nke ọnụ na-apụghị ịkọ.
2CO 10:1 Ma mụ onwe m bụ Pọl, ji ịdị nwayọọ na obi umeala nke Kraịst na-arịọ unu. Mụ, onye na-adị umeala mgbe mụ na unu nọ nʼihu nʼihu, ma na-enwe mkwuwa okwu nʼebe unu nọ mgbe m na-anọghị nʼetiti unu.
2CO 10:2 Arịọ m unu, ka m ghara inwe obi ike mgbe m bịarutere dịka o kwesiri nʼebe ụfọdụ ndị nọ, site na iguzogide ndị ahụ na-eche na anyị na-eme ihe dị ka ndị ụwa si eme ya.
2CO 10:3 Ọ bụ ezie na anyị na-ebi dịka mmadụ, ma anyị adịghị ebu agha dịka usoro anụ ahụ si dị.
2CO 10:4 Nʼihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke mmadụ nkịtị nke ụwa, kama ha nwere ike nke mmụọ ịla ebe niile e wusiri ike nʼiyi.
2CO 10:5 Anyị na-ala ịrụ ụka niile na okwu ụgha niile nʼiyi, nke na-egbochiri ụmụ mmadụ ụzọ e si amata Chineke, na-eme ka echiche niile hulata isi nʼokpuru Kraịst.
2CO 10:6 Anyị nọ na njikere ịta erubeghị isi niile ahụhụ, mgbe irube isi gị zuruoke.
2CO 10:7 Unu na-ele anya nʼihe ndị dị unu nʼihu. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe doro anya nye onye ọbụla na ha bụ nke Kraịst, ha matakwa na onwe ha, na otu ahụ ha bụ nke Kraịst na anyị onwe anyị bụkwa nke ya.
2CO 10:8 Ugbu a, ọ bụrụ na m anya isi banyere ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nʼebe unu nọ, ike ahụ o nyere m iji wulie unu elu, ọ bụghị iji wedaa unu ala, ihere agaghị eme m nʼihi nke a.
2CO 10:9 Achọghị ka ọ dịka m a ga-asị na m sitere nʼakwụkwọ ozi m na-emenye unu egwu.
2CO 10:10 Nʼihi na ha na-asị, “Akwụkwọ ozi ya dị arọ dịkwa ike, ma na mmadụ, ma nʼọdịdị ya na mmadụ adịghị ike, okwu ọnụ ya bụkwa ihe na-abaghị uru.”
2CO 10:11 Ma ana m eme ka ndị dị otu a ghọta na ihe anyị na-ekwu site nʼakwụkwọ ozi mgbe anyị na-anọghị nʼetiti unu, ka anyị ga-eme ma anyị nọrọ nʼetiti unu.
2CO 10:12 Anyị enweghị anya ike ihazi ọnọdụ maọbụ were onwe anyị tụnyere ndị ụfọdụ na ndị ahụ nʼeto onwe ha. Ma mgbe ha na-eji onwe ha na-atụ onwe ha, werekwa onwe ha na-atụnyere onwe ha, ha adịghị ezipụta nghọta.
2CO 10:13 Ma anyị onwe anyị, adịghị anya isi banyere ihe ọbụla anyị na-enweghị ike ime. Kama anyị ga-anya isi nʼoke ọrụ ahụ Chineke kenyere anyị, ka anyị rụrụte ọ bụladị ruo nʼebe unu nọ.
2CO 10:14 Nʼihi na anyị adịghị ekwu okwu karịrị ọnụ anyị mgbe anyị na-etinye anya nʼihe gbasara unu, nʼihi na ọ bụ anyị buru ụzọ bịakwute unu, ikwusara unu oziọma gbasara Kraịst.
2CO 10:15 Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ niile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nʼetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu ga na-eto eto mgbe niile, ka ọrụ ya nʼetiti unu bụrụ nke ga-eto eto.
2CO 10:16 Nke a ga-eme ka anyị nwee ike zisaa oziọma ahụ na mba ndị ọzọ ndị dị nʼofe ala unu, ghara iji ọrụ arụrụ nʼebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ na-etu ọnụ.
2CO 10:17 Ma, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime Onyenwe anyị.”
2CO 10:18 Nʼihi na ọ bụghị onye ji aka ya bulie onwe ya elu ka a na-anabata, kama ọ bụ onye Onyenwe anyị jiri aka ya bulie.
2CO 11:1 Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na unu ga-anagide m ka m kwuo okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Biko nagidenụ m.
2CO 11:2 Ekworo m nwere nʼebe unu nọ bụ ekworo nke Chineke. Ekwere m nkwa iwere unu nye otu di, ya bụ Kraịst, ka m nwe ike chee unu nʼihu ya dịka nwaagbọghọ dị ọcha nke na-amaghị nwoke.
2CO 11:3 Ma ana m atụ egwu, na dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie unu, mee ka unu kwụsị iji obi dị ọcha na uche ziri ezi jeere Kraịst ozi.
2CO 11:4 Nʼihi na unu gaara anara onye ọzọ bịakwutere unu na-ekwusa Jisọs ọzọ nke na-abụghị nke anyị kwusara, unu gaara anarakwa ike nke mmụọ ọzọ dị iche na-abụghị ike nke Mmụọ Nsọ ahụ unu natara, unu gaara ekwenyekwa na nkuzi ọzọ dị iche, na-abụghị oziọma ahụ nke unu natara.
2CO 11:5 Ma echeghị m na ọ dị ụzọ ọbụla ndị ozi a maara aha ha si kara m mma.
2CO 11:6 Ọ bụrụ na m abụghị onye ọka okwu, abụ m onye ọka mmụta. Anyị akọwarala unu nke a ọtụtụ mgbe nʼụzọ dị iche iche nʼihe niile.
2CO 11:7 Ọ ga-abụ na-emere m ihe ọjọọ mgbe m wedara onwe m ala ka e welie unu elu, nʼihi nʼanaghị m unu ihe ọbụla mgbe m na-ekwusara unu oziọma Chineke?
2CO 11:8 Ọ bụ nzukọ nọ nʼebe ọzọ nyeere m aka mgbe m na-arụ ọrụ nʼetiti unu. Ọ bụ site nʼaka ha ka m ji nata nkwado, dịka ụgwọ ọrụ m, ka m nwee ike inyere unu aka.
2CO 11:9 Ma mgbe m nọ nʼetiti unu abụghị m ibu arọ nye onye ọbụla nʼoge mkpa m. Nʼihi na ụmụnna si Masidonia wetaara m ihe niile na-akpa m mkpa. Ebe ọ bụ na m gbalịrị debe onwe m, ka m ghara ịbụ ibu arọ nye unu nʼụzọ ọbụla nʼoge gara aga, agaghị m abụkwa ibu arọ nye unu nʼoge dị nʼihu.
2CO 11:10 Ebe eziokwu nke Kraịst dị nʼime m, ịnya isi m nke a agaghị akwụsị na mpaghara Akaịa niile.
2CO 11:11 Nʼihi gịnị? Ọ bụ nʼihi na m ahụghị unu nʼanya? Chineke maara na m hụrụ unu nʼanya.
2CO 11:12 Ma aga m aga nʼihu na-arụ ọrụ m na-achọghị ka unu nyere m aka nʼụzọ ọbụla ka m si otu a mee ka ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị ozi ghara ịnya isi kwuokwa na ha na-arụ ọrụ dịka anyị si arụ ọrụ anyị nʼetiti unu.
2CO 11:13 Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst.
2CO 11:14 Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.
2CO 11:15 Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị.
2CO 11:16 Dịka m kwuru na mbụ, ka onye ọbụla ghara iche na m bụ onye na-enweghị uche. Ọ bụrụkwarị na unu na-eche ụdị echiche a, biko naranụ m dịka onye na-enweghị uche, ka m nwee ike ịnya isi nke nta dịka ndị ọzọ si eme.
2CO 11:17 Ma nʼihe m dabeere na-anya isi, adịghị m ekwu okwu dịka Onyenwe anyị ga-ekwu, maọbụ dịka onye na-enweghị uche.
2CO 11:18 Ebe ọtụtụ mmadụ na-anya isi banyere ihe ha bụ nʼụzọ ụwa si eme. Mụ onwe m ga-anyakwa isi.
2CO 11:19 Unu were obi ụtọ na-anagide ndị na-enweghị uche, ebe unu onwe unu nwere uche.
2CO 11:20 Unu na-anagide ya ma ọ bụrụ na onye ọbụla eme unu ndị ohu ha, maọbụ jiri anya ike nakọrọ unu ihe unu nwere, maọbụ ghọgbuo unu, maọbụ bulie onwe ya elu dịka ha karịrị unu, maọbụ maa unu uraa nʼihu.
2CO 11:21 Nʼezie, ọ bụ ihere m, ịnabata na anyị bụ ndị na-adịghị ike nʼezie nye nke a. Ọ bụrụ na onye ọbụla anwaa anwaa nyaa isi nʼihe ọbụla (ana m ekwu dịka onye nʼenweghị uche), mụ onwe m ga-anyakwa isi.
2CO 11:22 Ha bụ ndị Hibru? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị Izrel? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị agbụrụ Ebraham? Mụ onwe m bụkwa.
2CO 11:23 Ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi? (Ana m ekwu dịka onye anya na-adịghị mma.) Ma mụ onwe m ejela ozi karịa. Adọgbuola m onwe m nʼọrụ karịa ha niile. Etinyela m nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe, tinyere ọtụtụ ihe otiti, mgbe mgbe anọọla m nʼọnụ ọnwụ.
2CO 11:24 Ugboro ise ka ndị Juu pịara m ọnụ ụtarị iri anọ e wepụrụ otu.
2CO 11:25 E jirila okporo igwe tie m ugboro atọ. Atụrụ m nkume otu ugboro. Ugboro atọ ka ụgbọ mmiri m nọ nʼime ya kpuru nʼoke osimiri. Anọọla m otu abalị na ụbọchị so ya nʼelu oke osimiri ebe mmiri na-ebugharị m.
2CO 11:26 Ejeela m ọtụtụ ogologo ije nke ọtụtụ ihe ize ndụ dị nʼime ya. Nʼize ndụ site nʼosimiri, ize ndụ site na ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike, ize ndụ site nʼaka ndị obodo nke aka m. Ọtụtụ mgbe ka m zere ndụ site nʼaka ndị mba ọzọ, nʼime obodo ukwu, nʼọzara ma nʼoke osimiri; na nʼaka ndị kpọrọ onwe ha ụmụnna m, ma ha bụ ndị ụgha.
2CO 11:27 Adọgbuola m onwe m nʼọrụ, anọọla m nʼọnọdụ ịhụju anya na ịmụ anya ọtụtụ abalị. Ọtụtụ mgbe ana m anọ agụụ na-erighị ihe ọbụla, maọbụ ịṅụ ihe ọbụla. Anọọla m ọtụtụ mgbe nʼoge oyi na-ama jijiji nʼihi enweghị uwe dị mma m ji achụ oyi.
2CO 11:28 Ma e wezuga ihe ndị a niile, ana m anọ nʼechiche mgbe niile banyere otu ihe niile si aga nʼime nzukọ.
2CO 11:29 Onye bụ onye ahụ na-adịghị ike nke m na-adịghị eso ya kere oke na-adịghị ike ya? Onye ka e dubara na mmehie nke ọnọdụ ya na-adịghị emetụ m nʼobi?
2CO 11:30 Kama ọ bụrụ na o kwesiri ka m nyaa isi aga m anya isi banyere ihe ndị ahụ na-egosi adịghị ike m.
2CO 11:31 Chineke, na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesiri ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a niile m na-ekwu bụ eziokwu.
2CO 11:32 Nʼobodo Damaskọs, onye ọchịchị ala ahụ nke eze obodo ahụ a na-akpọ Aretas họpụtara, ndị na-eche obodo Damaskọs nche ka ha jide m.
2CO 11:33 Ma e tinyere m nʼime nkata, site nʼoghere dị na mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu wedata m, m gbanarị ya.
2CO 12:1 Aghaghị m ịnya isi, ọ bụ ezie na ọ baghị uru, ugbu a ka m gwa unu ihe banyere ọhụ m hụrụ, na ihe niile Onyenwe anyị kpughere gosi m.
2CO 12:2 Amaara m otu nwoke nọ nʼime Kraịst, onye e duuru gaa nʼeluigwe nke atọ ihe dị ka afọ iri na anọ gara aga, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke ma.
2CO 12:3 Amatakwara m nwoke dị otu a, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke maara
2CO 12:4 onye a, nke a kpọọrọ banye na paradaịs, ebe ọ nụrụ ihe ọnụ mmadụ na-apụghị ịkọwa, nke e nyeghịkwa mmadụ ọbụla ike ikwu ihe banyere ya.
2CO 12:5 Ekwesiri m ịnya isi nʼihi nwoke dị otu a ma agaghị m anya isi maka mụ onwe m, ma ọ bụghị maka adịghị ike m.
2CO 12:6 A sị na m chọrọ ịnya isi, agaghị m abụ onye nzuzu, nʼihi na aga m ekwu naanị eziokwu. Otu ọ dị, agaghị m anya isi ka onye ọbụla ghara ịgụ ọnọdụ m karịa ihe ọ hụrụ nʼime m, maọbụ karịa ihe ọ nụrụ nʼọnụ m.
2CO 12:7 Ma nʼihi na ọtụtụ ihe ndị a m ji anya m hụ bụ ihe pụrụ ime ka m bulie onwe m elu karịa ka o si kwesi. E tinyere ihe mgbu nʼanụ ahụ m ka ọ na-adụ m dịka ogwu. Ihe mgbu a dị nʼanụ ahụ m na-eti m aka dịka onyeozi nke ekwensu, na-eme ka m ghara ịfụlị onwe m elu karịa.
2CO 12:8 Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọ Onyenwe anyị ka o wepụrụ m ahụ mgbu a.
2CO 12:9 Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m.
2CO 12:10 Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa.
2CO 12:11 Emeela m onwe m onye nzuzu ma unu onwe unu rugidere m ime ya. O kwesiri ka unu bụrụ ndị mbụ ga-eto m. Ọ bụ ezie a na-abụghị m ihe ọbụla, ma o were m anya na ọ dịghị ụzọ ọbụla m si dị ala nʼebe ndị ahụ unu na-eche na ha kachasị elu nʼetiti ndị ozi.
2CO 12:12 Ejiri m ndidi rụọ ọrụ nʼetiti unu, ihe iji gosi na abụ m nwaazụ nʼeziokwu. Egosiri m unu ihe ịrịbama, ọrụ ebube dị iche iche, na ọtụtụ oke ọrụ.
2CO 12:13 Olee ụzọ unu si dị ala nʼebe chọọchị ndị ọzọ dị, ma ọ bụghị na m abụghị ibu arọ nye unu? Gbagharanụ m mmejọ a.
2CO 12:14 Nke a bụ ugboro atọ m na-ejikere ịbịakwute unu. Agaghị m abụrụ unu ibu arọ, ihe dị m mkpa abụghị akụ unu nwere, kama unu onwe unu. Ọ bụghị ụmụntakịrị ka ọ dịrị ịkpadoro nne na nna ha ihe, kama ọ bụ ọrụ dịrị nne na nna ịkpadoro ụmụ ha ihe.
2CO 12:15 Nʼezie, ọ na-atọ m ụtọ iwere onwe m na ihe niile m nwere nye unu, nʼihi na ahụrụ m unu nʼanya. Ma ọ bụrụ na m hụrụ unu nʼanya karịa, ọ ga-adị mma ma unu hụ m nʼanya nke nta?
2CO 12:16 Nʼagbanyeghị na-abụrụ m unu ibu arọ, ụfọdụ nʼime unu na-ekwu, ọ bụ ezie na ọ dịghị anara anyị ihe ọbụla, maọbụ onye aghụghọ. Ma eleghị anya, o nwere ụzọ aghụghọ dị iche iche o si anara anyị ihe.
2CO 12:17 Ọ dị onye ọbụla m ziteere unu, iji si nʼaka ya rigbuo unu?
2CO 12:18 Arịọrọ m Taịtọs ka ọ bịakwute unu, ya na nwanna anyị nwoke ọzọ. Taịtọs o rigburu unu? O nwere ihe dị iche nʼuche na omume mụ na ya?
2CO 12:19 Unu chere na ihe anyị na-eme oge niile ndị a bụ ịgọpụ onwe anyị nʼihu unu? Ọ bụ nʼihu Chineke ka anyị na-ekwu nke a nʼime Kraịst. Ndị m hụrụ nʼanya, ihe ndị a anyị na-ekwu bụ maka ọdịmma unu.
2CO 12:20 Nʼihi na ihe na-atụ m egwu bụ na mgbe m bịara nʼetiti unu, ihe m ga-ahụ agaghị atọ m ụtọ. Mgbe ahụ mmeso m ga-emeso unu agakwaghị atọ unu atọ. Nʼihi na ana m atụ egwu na mgbe m bịakwutere unu ọzọ, aga m ahụ ọtụtụ nʼime unu ka unu na-ese okwu, aga m ahụ ka unu na-ekwosa ibe unu ekworo, aga m ahụ unu ka unu na-akpasu ibe unu iwe. Aga m ahụ ọtụtụ ndị na-afụli onwe ha elu, ndị na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ dị iche iche megide ndị ọzọ; aga m ahụ ọtụtụ ndị jupụtara nʼaghụghọ na ịkpa iche iche.
2CO 12:21 Ana m atụ egwu na mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, Chineke m ga-eme ka m weda onwe m ala nʼihu unu, mee ka m kwa akwa nʼihi ụfọdụ nʼime unu ndị mehiere na mbụ, ma ha achọghị ichegharị site nʼihe ọjọọ ha mere, na nʼihi ọtụtụ nʼime unu na-adị ndụ rere ure, ndụ na-adịghị ọcha, ndụ ịkwa iko, na ndụ ọjọọ.
2CO 13:1 Nke a ga-eme ya ugboro atọ m na-abịa ileta unu. Ọ bụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara ka a ga-eme ka okwu niile guzoro.
2CO 13:2 Mgbe m bịara leta unu nke ugboro abụọ, abaara m ndị niile dara iwu nʼoge gara aga na mmadụ ndị ọzọ mba, dọọkwa ha aka na ntị, ihu na ihu. Ugbu a m na-anọghị ya, ana m adọkwa ha aka na ntị ọzọ, ọ bụrụ na m bịa ọzọ hụ na ndị mehiere na mbụ echegharịghị, aga m emesi ha ike.
2CO 13:3 Ebe unu chọrọ ka e gosi na Kraịst na-ekwu okwu nʼime m, ọ dịghị egosi adịghị ike mgbe ọ na-emeso unu omume, kama ọ na-eme ka ike ya pụta ìhè nʼebe unu nọ.
2CO 13:4 Ọ bụ ezie na a kpọgidere ya na-adịghị ike, ma ugbu a, ọ na-adị ndụ site nʼike dị ukwuu nke Chineke. Anyị bụkwa ndị na-adịghị ike nʼime ya, ma ozi anyị na-ejere unu na mmekọrịta anyị na unu, anyị ga-eso ya dị ndụ site nʼike nke Chineke.
2CO 13:5 Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu nyochaa onwe ya, tulekwa omume ya, mara ma ọ ka kwudosiri ike nʼokwukwe ya. Ọ bụ na unu aghọtaghị na Jisọs Kraịst nọ nʼime unu? Ma ọ bụghị na unu enyochaala onwe unu hụ na unu emeghị nke ọma.
2CO 13:6 Enwere m olileanya na unu niile ga-achọpụta na anyị adaghị ule ahụ.
2CO 13:7 Ma anyị na-arịọ Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọọ ọbụla. Anyị anaghị eme nke a iji gosi na anyị kwesiri ekwesi, kama ka unu nwee ike mee ihe dị mma, nʼagbanyeghị na ọ ga-adị ka a ga-asị na anyị emeghị nke ọma nʼọrụ anyị.
2CO 13:8 Nʼihi na anyị apụghị ime ihe ọbụla megide eziokwu, kama anyị na-eme ihe niile nʼihi eziokwu.
2CO 13:9 Anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe anyị na-adịghị ike ma hụ na unu dị ike. Ihe anyị na-arịọ Chineke bụ ka unu tozuo oke.
2CO 13:10 Ana m edere unu akwụkwọ a ugbu a, nʼihi na-achọghị m ịbara unu mba na inye unu ntaramahụhụ mgbe m bịara. Achọkwaghị m iji ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nye unu ntaramahụhụ, kama achọrọ m iji ya wulie unu elu dịka ụlọ.
2CO 13:11 Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu.
2CO 13:12 Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu.
2CO 13:13 Ndị nsọ niile na-ekelekwa unu.
2CO 13:14 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya Chineke, na mmekọ nke Mmụọ Nsọ dịnyere unu niile.
GAL 1:1 Pọl, onyeozi, na-abụghị site na nhọpụta nke mmadụ maọbụ site nʼike nke mmadụ, kama ọ bụ site nʼaka Jisọs Kraịst na Chineke Nna, onye mere ka ọ site nʼọnwụ bilie.
GAL 1:2 Ndị ụmụnna niile ndị mụ na ha nọ nʼebe a, Na-edegara nzukọ niile dị na Galeshịa.
GAL 1:3 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
GAL 1:4 Onye nyere onwe ya nʼihi mmehie anyị niile dị ka nzube Chineke bụ Nna anyị si dị, ịzọpụta anyị site nʼoge ọjọọ a nke anyị bi nʼime ya.
GAL 1:5 Onye otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
GAL 1:6 O juru m anya, na unu esitela nʼebe onye ahụ kpọrọ unu site nʼamara Kraịst wezuga onwe unu, na-agbaso oziọma ọzọ,
GAL 1:7 nke na-abụghị oziọma. O doro anya na ụfọdụ mmadụ na-etinye unu nʼọnọdụ mgbagwoju anya, mgbe ha na-agbalị ịgbanwe oziọma nke Kraịst.
GAL 1:8 A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere nʼeluigwe bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ.
GAL 1:9 Dị ka anyị buru ụzọ kwuo ya na mbụ, ka m kwuokwa ya ọzọ: Ọ bụrụ na onye ọbụla na-ekwusara unu oziọma dị iche na nke ahụ unu nabatara, ka onye ahụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ.
GAL 1:10 Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ Chineke ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu Kraịst.
GAL 1:11 Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na oziọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nʼuche ya.
GAL 1:12 Nʼihi na anataghị m ya site nʼaka mmadụ ọbụla, ọ dịkwaghị onye ọbụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya bụ onye kpughere ya nye m.
GAL 1:13 Amara m na unu anụla ihe banyere ndụ m nʼoge gara aga, nʼofufe ndị Juu, na otu m si jiri ike kpagbuo nzukọ Chineke nʼebe niile, ma gbalịsiekwa ike ibibi ya.
GAL 1:14 Abụ m otu nʼime ndị amaara aha ha nʼetiti ndị ọgbọ m, nʼihe banyere ofufe ndị Juu. Nʼihi oke ịnụ ọkụ nʼobi nke m nwere ịgbaso na idebezu ụkpụrụ omenaala na ofufe, nke nna nna m ha.
GAL 1:15 Ma mgbe ọ tọrọ Chineke ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya,
GAL 1:16 ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya.
GAL 1:17 Ejekwaghị m Jerusalem ịhụ ndị ahụ bu m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama a gara m Arebịa, ma laghachikwa azụ na Damaskọs.
GAL 1:18 Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ịhụ Sefas. Anọnyekwara m ya ụbọchị iri na ise.
GAL 1:19 Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ m hụrụ, ma ọ bụghị naanị Jemis, nwanne Onyenwe anyị.
GAL 1:20 Ana m agwa unu okwu a nʼihu Chineke. Ihe ndị a m na-ekwu abụghị okwu ụgha.
GAL 1:21 Emesịa, agara m Siria na Silisia.
GAL 1:22 Ma ndị Kraịst nọ na chọọchị niile dị nʼala Judịa amaghị onye m bụ.
GAL 1:23 Naanị ihe ha na-ekwu bụ, “Onye ahụ na-esogbu anyị na mbụ na-ekwusazi ugbu a okwukwe ahụ ọ gbalịsịrị ike ibibi na mbụ.”
GAL 1:24 Ha nyere Chineke otuto nʼihi m.
GAL 2:1 Mgbe afọ iri na anọ gasịrị, ejeghachiri m Jerusalem ọzọ. Mụ na Banabas laghachiri Jerusalem, akpọkwara m Taịtọs jee.
GAL 2:2 Agara m nʼihi mkpughe m nwere. Na nzukọ nzuzo nke m na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere oziọma nke m na-ekwusa nʼetiti ndị mba ọzọ. Nʼihi na-achọghị m ka ọrụ niile m rụrụ nʼoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu.
GAL 2:3 Ọ bụladị Taịtọs onye mụ na ya so, o nweghị onye manyere ya ka e bie ya ugwu nʼagbanyeghị na ọ bụ onye Griik.
GAL 2:4 Ndị ahụ na-abụghị ndị kwere ekwe nʼezie e zobatara na nzukọ inyochapụta otu anyị si nwere onwe anyị nʼime Kraịst Jisọs, ka ha nwee ike mee anyị ndị ohu.
GAL 2:5 Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nʼihe ha kwuru, nʼihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nʼoziọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọbụla nʼetiti unu.
GAL 2:6 Banyere ndị a na-ewe ka ndị dị ndu dị mkpa, ihe ọbụla ọnọdụ ha bụ ewetaghị mgbanwe ọbụla nʼebe m nọ, nʼihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya nʼihu. Ndị ahụ atụkwasịghị ihe ọbụla nʼoziọma m na-ezisa.
GAL 2:7 Ma nʼaka nke ọzọ, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izisa oziọma nʼetiti ndị e bighị ugwu, dịka e nyere Pita izisa oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu.
GAL 2:8 Nʼihi na Chineke onye si nʼaka Pita na-arụ ọrụ onyeozi oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu, sikwa nʼime m na-arụ ọrụ onyeozi izisara ndị mba ọzọ oziọma.
GAL 2:9 Mgbe Jemis, Sefas na Jọn ndị a maara dị ka ide ji ụlọ nʼetiti ndị ndu ahụ niile nara m na Banabas aka nnwekọ, nabatakwa amara e nyere m. Ha gbara anyị ume, sị anyị gaa nʼihu nʼọrụ anyị, ikwusa oziọma nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nʼihu ịrụ ọrụ nke ha nʼetiti ndị e biri ugwu.
GAL 2:10 Ọ bụ naanị otu ihe ka ha rịọrọ anyị, nke bụ ka anyị cheta ndị ogbenye. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike ime.
GAL 2:11 Ma mgbe Sefas bịaruru Antiọk, eguzogidere m ya nʼihu ya, nʼihi na ihe o mere mara ya ikpe.
GAL 2:12 Tupu ndị Jemis zitere abịaruo ebe ahụ, ya na ndị mba ọzọ na-erikọ nri, ma mgbe ha rutere, ọ wepụrụ aka na nri laghachi azụ nʼihi na egwu ndị e biri ugwu na-atụ ya.
GAL 2:13 Ndị Juu ụfọdụ sonyekwara ya inwe ihu abụọ a, nke mere na e si otu a duhiekwa Banabas nʼonwe ya.
GAL 2:14 Ma mgbe m hụrụ na ha adịghị eme ihe dị ka eziokwu nke oziọma ahụ si dị, agwara m Sefas okwu nʼihu ha niile, sị, “Ọ bụrụ na gị nwa onye Juu na-ebi ndụ dịka onye mba ọzọ, na-abụghị dịka onye Juu, olee otu ị ga-esi manye ndị mba ọzọ ka ha na-ebi ndụ dịka ndị Juu?”
GAL 2:15 Anyị onwe anyị bụ ndị Juu site nʼọmụmụ a mụrụ anyị, anyị abụkwaghị ndị mba ọzọ ndị mmehie,
GAL 2:16 ma anyị maara na a dịghị agụ mmadụ ọbụla dị ka onye ezi omume site nʼọrụ nke iwu kama ọ bụ naanị site nʼokwukwe na Jisọs Kraịst. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst ka a gụọ anyị na ndị ezi omume, site nʼokwukwe anyị kwere na Kraịst, ọ bụghị nʼihi na anyị rụrụ ọrụ nke iwu. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a ga-agụnye ka onye ezi omume nʼihi na ọ rụrụ ọrụ nke iwu.
GAL 2:17 Ma ọ bụrụ, na mgbe anyị na-achọ ka a gụọ anyị dị ka ndị ezi omume nʼime Kraịst, anyị onwe anyị a bụrụ ndị achọpụtara dịka ndị mmehie. Nke a, ọ pụtara na Kraịst na-akwado mmehie? Mba!
GAL 2:18 Kama, ọ bụrụ na m ewugharịa ihe ndị ahụ m buru ụzọ mebie, ana m egosi na m bụ onye na-emebi iwu.
GAL 2:19 Nʼihi na-esitere m nʼaka iwu nwụọ nʼebe iwu dị, ka m nwee ike dị ndụ nʼebe Chineke nọ. Akpọgidela mụ na Kraịst nʼobe.
GAL 2:20 Ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.
GAL 2:21 Anaghị m akpọ amara Chineke ihe na-enweghị isi. Nʼihi na a sị na a pụrụ ịgụ mmadụ dị ka onye ezi omume site nʼidebe iwu, mgbe ahụ ọnwụ Kraịst nwụrụ abaghị uru.
GAL 3:1 Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galeshịa! Onye napụrụ unu akọnuche unu? Nʼihu unu ka a nọ kọwaa nʼụzọ doro anya mkpọgide nʼobe a kpọgidere Jisọs Kraịst.
GAL 3:2 Ọ bụ naanị otu ihe ka m chọrọ ịmata nʼaka unu. Unu natara Mmụọ Nsọ site nʼịrụ ọrụ iwu chọrọ, ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe?
GAL 3:3 Ọ ga-abụ na unu aghọọla ndị na-enweghị uche? Unu malitere site nʼike Mmụọ Nsọ, ma ugbu a unu na-akwụsịzi nʼike nke anụ ahụ?
GAL 3:4 Unu tara ọtụtụ ahụhụ dị otu a nʼefu, ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ nʼefu?
GAL 3:5 Mmụọ nsọ ahụ Chineke nyere unu na ọrụ ebube ọ rụrụ nʼetiti unu, o mere ha nʼihi iwu unu debere, ka ọ bụ nʼihi na unu nụrụ ma kwerekwa oziọma?
GAL 3:6 Nʼotu ụzọ ahụ, Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.
GAL 3:7 Matanụ nke a, na ọ bụ ndị nwere okwukwe bụ ụmụ Ebraham.
GAL 3:8 Dị ka ọ dị nʼAkwụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie Ebraham oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, “A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.”
GAL 3:9 Ya mere, ndị dabeere nʼokwukwe bụkwa ndị na-eso Ebraham, nwoke okwukwe ahụ eketa ngọzị.
GAL 3:10 Ma ndị niile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nʼihi na ha debere iwu niile, ka ọbụbụ ọnụ na-adakwasị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla na-edebeghị ọ bụladị otu nʼime iwu niile e dere nʼakwụkwọ iwu.”
GAL 3:11 Ugbu a, ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọbụla a na-agụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke, nʼihi na o debere iwu. Nʼihi na, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.”
GAL 3:12 Ma iwu ahụ adabereghị nʼokwukwe, kama, iwu kwuru sị, “Mmadụ ahụ na-eme ihe iwu kwuru bụ onye ga-enwe ndụ site na ha.”
GAL 3:13 Ma Kraịst agbapụtala anyị site nʼọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. Ọ ghọrọ ọbụbụ ọnụ nʼihi anyị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a kwụbara nʼelu osisi.”
GAL 3:14 Ọ dị otu a ka ngọzị ahụ e nyere Ebraham bụrụkwa nke ndị mba ọzọ site na Kraịst Jisọs. Ka anyị niile site nʼokwukwe nata nkwa ahụ, bụ Mmụọ Nsọ.
GAL 3:15 Ụmụnna m, ka m were ihe nlere anya site na ndụ a na-adị kwa ụbọchị kọwaa okwu a: Dị ka mmadụ na-enweghị ike iwepụ maọbụ ịtụkwasị ihe nʼọgbụgba ndụ e mere ka o guzosie ike, otu a ka ọ dịkwa nʼọnọdụ a.
GAL 3:16 Ọ bụ Ebraham ka e kwere nkwa ya na mkpụrụ ya. Akwụkwọ nsọ asịghị, “nʼọtụtụ mkpụrụ,” kama, ọ sịrị, “ma nye mkpụrụ gị,” ya bụ otu onye, onye bụ Kraịst.
GAL 3:17 Ihe m na-akọwa bụ nke a: Iwu ahụ e mere ka ọ malite ịdị narị afọ anọ na iri atọ (430) site na mgbe e kwere nkwa ahụ, emeghị ka ọgbụgba ndụ ahụ Chineke mere ka ọ dịrị hapụ iguzokwa, o mekwaghị ka nkwa ahụ bụrụ ihe e wezugara ewezuga.
GAL 3:18 Ọ bụrụ na inweta ihe nketa nke ya na nkwa ahụ so dabeere nʼiwu, mgbe ahụ, ihe nketa ahụ adabereghị na nkwa e kwere. Ma Chineke sitere nʼamara nye Ebraham ihe nketa ahụ site na nkwa o kwere ya.
GAL 3:19 Gịnị mere e ji nye iwu? E nyere iwu ndị a nʼihi njehie, mee ka iwu ndị a dịgide tutu ruo mgbe mkpụrụ ahụ bịara, bụ onye e kwere na nkwa. E sitere nʼaka onye ogbugbo mee ka ndị mmụọ ozi mee ka iwu ahụ dị ire.
GAL 3:20 Onye ogbugbo gosiri ihe karịrị otu onye, ma Chineke bụ otu.
GAL 3:21 Iwu ahụ ọ na-emegide nkwa nke Chineke? Mba. Nʼezie ọ dịghị. Nʼihi na a sị na e nwere iwu dị nke pụrụ inye mmadụ ndụ, mgbe ahụ, ezi omume gaara abịara mmadụ site nʼiwu.
GAL 3:22 Ma akwụkwọ nsọ mechibidoro ihe niile nʼokpuru mmehie ka e nwee ike nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst.
GAL 3:23 Ma tupu okwukwe abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutu ruo mgbe a ga-eme ka okwukwe pụta ìhè.
GAL 3:24 Ya mere, iwu bụ onye nlekọta anyị, ruo mgbe Kraịst bịara, ka a gụọ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe.
GAL 3:25 Ma ebe ọ bụ na okwukwe abịala, anyị anọkwaghị nʼokpuru onye nlekọta ọzọ.
GAL 3:26 Unu niile bụ ụmụ Chineke site nʼokwukwe nʼime Kraịst Jisọs.
GAL 3:27 Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst.
GAL 3:28 E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs.
GAL 3:29 Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke Kraịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ Ebraham, ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị.
GAL 4:1 Isiokwu m bụ nke a, mgbe nwa bụ onye ga-eketa ihe nna ya ka dị na nwata, ọnọdụ ya akaghị mma karịa nke ohu, ọ bụ ezie na akụ ahụ niile bụ nke ya.
GAL 4:2 Ma ha ka nọ nʼokpuru ndị nlekọta na ndị e tinyere ya nʼaka ruo oge nna ya kwuru.
GAL 4:3 Otu a ka ọnọdụ anyị dị, mgbe anyị bụ ụmụntakịrị. Anyị nọ dị ka ohu nʼokpuru mmụọ nke ụwa.
GAL 4:4 Ma mgbe oge a kara aka ruru, Chineke zitere Ọkpara ya, bụ onye amụrụ site na nwanyị, onye amụrụ nʼokpuru iwu,
GAL 4:5 ka ọ gbapụta ndị nọ nʼokpuru iwu, ime anyị ndị a ga-agụ dị ka ụmụ a họpụtara.
GAL 4:6 Ebe unu bụ ụmụ, Chineke zitere Mmụọ Ọkpara ya, ka ọ bịa biri nʼobi anyị, na-eti mkpu na-asị, “Abba, Nna.”
GAL 4:7 Ugbu a, ị bụkwaghị ohu, kama ị bụ nwa. Ebe ị bụ nwa, e meekwala ka ị bụrụ onye nketa site na Chineke.
GAL 4:8 Nʼoge gara aga, mgbe unu na-amaghị Chineke, unu bụ ohu nye chi niile nke na-abụghị dịka ha si pụta ụwa.
GAL 4:9 Ma ugbu a, unu matarala Chineke, ka m ga-asị na Chineke amatala ndị unu bụ, gịnị mere unu ji chọọ ịtụgharị azụ laghachi nʼokpukpe ndị ahụ na-enweghị isi, nke ike ọbụla na-adịghị nʼime ha? Unu chọrọ ka ha mee unu ndị ohu ha ọzọkwa?
GAL 4:10 Unu na-edebe ụbọchị ụfọdụ, na ọnwa ụfọdụ, na oge ụfọdụ, na afọ ụfọdụ.
GAL 4:11 Egwu na-atụ m na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti unu abụrụla ihe efu.
GAL 4:12 Ezi ụmụnna m, arịọọ m unu, meenụ onwe unu dị ka mụ onwe m, nʼihi na mụ onwe m emela onwe m ka m dị ka unu. O nweghị ihe ọjọọ ọbụla unu mere m.
GAL 4:13 Unu maara na ọ bụ nʼime adịghị ike nke anụ ahụ ka m ji kwusaara unu oziọma a.
GAL 4:14 Ọ bụ ezie, ọnọdụ m nʼoge ahụ bụ ọnwụnwa nʼebe unu nọ, unu eledaghị m anya, maọbụ jụ ige m ntị. Kama unu nabatara m, dị ka mmụọ ozi Chineke, maọbụ dị ka a ga-asị na m bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya.
GAL 4:15 Ebee ka mmụọ nke obi ụtọ ahụ unu nwere nọ? Nʼihi na m na-agba ama, na-asị na ọ bụrụ ihe a pụrụ ime, unu gaara aghụpụta anya unu nye m.
GAL 4:16 Ugbu a, aghọọla m onye iro unu, nʼihi na m na-agwa unu eziokwu?
GAL 4:17 Ha na-ezipụta mmasị nʼebe unu nọ, ma ọ bụghị maka ọdịmma unu. Ha chọrọ ikewapụ unu nʼebe m nọ, ka unu nwee mmasị nʼebe ha nọ.
GAL 4:18 Maka ebumnuche dị mma, ọ dị mma inwe mmasị mgbe niile. Ọ bụghị naanị mgbe mụ na unu nọ.
GAL 4:19 Ụmụntakịrị m, ndị m kwe maka ha nọdụ nʼọnọdụ ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ọzọ, na-eche ụbọchị ahụ a ga-eme ka ụdịdị Kraịst dị nʼime unu.
GAL 4:20 Ọ gaara adị m mma ma a sị na m nọ nʼetiti unu ugbu a, nwee ike ịmata otu m ga-esi gbanwee olu okwu m, nʼihi na-amaghị m ihe m kwesiri ime nʼihi ọnọdụ unu.
GAL 4:21 Gwanụ m, unu ndị na-eche na ọ dị mkpa idebe iwu, unu agaghị aṅaa ntị na ihe iwu ahụ kwuru?
GAL 4:22 Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ na Ebraham nwere ụmụ nwoke abụọ. Otu nʼime ha bụ nwa nke ohu ya nwanyị mụrụ, nke ọzọ bụ nke nwunye ya na-abụghị ohu mụtara.
GAL 4:23 Nwa ahụ nke ohu nwanyị ahụ mụrụ bụ onye amụrụ site na anụ ahụ. Ma nwa ahụ nwunye ya na-abụghị ohu mụtara bụ onye a mụrụ site na nkwa.
GAL 4:24 Anyị ga-ewere ihe ndị a dị ka ihe ịmaatụ, nʼihi na ụmụ nwanyị abụọ ndị a nọchiri anya ọgbụgba ndụ abụọ. Otu ọgbụgba ndụ sitere nʼUgwu Saịnaị ma mụọkwa ụmụ ndị bụ ohu: nke a bụ Hega.
GAL 4:25 Hega bụ Ugwu Saịnaị nke dị nʼArebịa. Ọ dabara nʼọnọdụ Jerusalem nke ugbu a, nʼihi na ya na ụmụ ya nọ nʼohu.
GAL 4:26 Ma nwanyị nke ọzọ nọ ọnọdụ Jerusalem nke dị nʼelu, nke nwe onwe ya. Ọ bụkwa ya bụ nne anyị.
GAL 4:27 Nʼihi na e dere ya, “Ṅụrịa ọṅụ, gị nwanyị aga, onye na-amụtaghị nwa. Tie mkpu ọṅụ, tisiekwa mkpu akwa ike gị onye ime nwa na-emetụbeghị, nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị nwere dị.”
GAL 4:28 Ugbu a, ụmụnna m, unu bụ ụmụ ahụ nke e kwere na nkwa, dị ka Aịzik.
GAL 4:29 Nʼoge ahụ, nwa ahụ a mụrụ nʼụzọ anụ ahụ kpagburu nwa ahụ a mụrụ site nʼike nke Mmụọ Nsọ. Otu a ka ọ dịkwa nʼoge a.
GAL 4:30 Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya, nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị a apụghị isoro nwa nke nwanyị na-abụghị ohu kerikọta oke.”
GAL 4:31 Ya mere, ụmụnna m, anyị abụghị ụmụ nke nwanyị ohu, kama anyị bụ ụmụ nke nwanyị nwere onwe ya.
GAL 5:1 Kraịst emeela ka anyị pụọ nʼohu, nʼihi anyị inwere onwe anyị. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu e nyeghị onwe unu nʼọnọdụ ohu ọzọ.
GAL 5:2 Geenụ m ntị, mụ onwe m bụ Pọl na-agwa unu nke a. Ọ bụrụ na unu anabata obibi ugwu, Kraịst agaghị abara unu uru ọbụla.
GAL 5:3 Ka m kwuokwa ya ọzọ, onye ọbụla kweere ka e bie ya ugwu ji ụgwọ idebezu iwu niile ahụ.
GAL 5:4 E kewapụla unu nʼebe Kraịst nọ, unu ndị a ga-agụnye na ndị ezi omume site nʼiwu. Unu adapụla nʼamara ya.
GAL 5:5 Nʼihi na anyị onwe anyị nwere olileanya na site nʼike nke Mmụọ Nsọ, a ga-agụ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe anyị.
GAL 5:6 Nʼihi nʼime Kraịst Jisọs, obibi ugwu maọbụ ebighị ugwu abaghị uru. Ihe dị mkpa bụ okwukwe nke na-egosi onwe ya site nʼịhụnanya.
GAL 5:7 Unu na-agbabu ọsọ nke ọma, onye gbochiri unu ikwenyere eziokwu ahụ?
GAL 5:8 Ụdị nkwagide ahụ esiteghị nʼebe Onye ahụ kpọrọ unu bịa.
GAL 5:9 Nwantịntị ihe na-eko achịcha na-eme ka ogbe ụtụ ọka a gwọrọ agwọ koo.
GAL 5:10 Enwere m ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị na unu agaghị eche echiche nʼụdị a ọzọ, ma ikpe ọmụma ga-adịrị onye ọbụla na-eduhie unu ọzọ.
GAL 5:11 Ụmụnna m, ọ bụrụ nʼezie na m na-ekwusa mkpa obibi ugwu dị, gịnị mere e ji nọgide na-akpagbu m? Ọ bụrụ na m mee otu ahụ, ewepụla m ihe ọdachi ahụ dị nʼobe.
GAL 5:12 Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ahụ na-esogbu unu ga-eme onwe ha ndị onozi.
GAL 5:13 Nʼihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu ekwela ka mnwere onwe unu bụrụ ohere nye anụ ahụ unu, kama werenụ ịhụnanya na-agbara ibe unu odibo.
GAL 5:14 Nʼihi na ọ bụrụ na a chịkọta iwu niile nʼotu, ihe iwu niile na-ekwu bụ nke a, “Na-ahụnụ ndị ọzọ nʼanya dịka unu si hụ onwe unu nʼanya.”
GAL 5:15 Ọ bụrụ na unu na-akọcha ibe unu, na-eji ọnụ unu na-ekwutọ ha, kpacharanụ anya ka unu hapụ ịla onwe unu nʼiyi.
GAL 5:16 Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ.
GAL 5:17 Nʼihi na ihe anụ ahụ chọrọ dị iche nʼihe Mmụọ Nsọ chọrọ. Ihe Mmụọ Nsọ chọrọ dịkwa iche nʼihe anụ ahụ chọrọ. Ịgba mgba dị nʼetiti ha na-eme ka ị hapụ inwe ike mee ihe ị chọrọ ime.
GAL 5:18 Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nʼokpuru iwu.
GAL 5:19 Ugbu a, ọrụ nke anụ ahụ pụtara ihe: ịkwa iko, adịghị ọcha na agụụ ịkwa iko.
GAL 5:20 Ikpere arụsị, iri amụsụ, ibu iro nʼobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.
GAL 5:21 Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke.
GAL 5:22 Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi,
GAL 5:23 ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.
GAL 5:24 Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe.
GAL 5:25 Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi.
GAL 5:26 Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị.
GAL 6:1 Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu.
GAL 6:2 Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
GAL 6:3 Ọ bụrụ na onye ọbụla na-eche na o nwere ihe ya bụ mgbe o nweghị ihe ọ bụ, onye ahụ na-eduhie onwe ya ụzọ.
GAL 6:4 Ka onye ọbụla nyocha ọrụ ya, ma ọ bụrụ na ọrụ ya dị mma, mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ihe ịnya isi nʼime onwe ya na-abụghị nʼebe ọrụ onye ọzọ dị.
GAL 6:5 Nʼihi na onye ọbụla ga-ebu ibu nke dịịrị ya.
GAL 6:6 Ka onye a na-akụziri okwu ahụ jisie ike ka ya na onye nkuzi ya na-ekekọ ezi ihe niile.
GAL 6:7 Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka ọ na-aghọrọ.
GAL 6:8 Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi.
GAL 6:9 Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.
GAL 6:10 Nʼihi nke a, mgbe anyị nwere oghere ka anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, ọkachasị nʼebe ndị ezinaụlọ nke okwukwe anyị nọ.
GAL 6:11 Leenu otu mkpụrụ akwụkwọ m ji aka m dee nʼakwụkwọ ozi a si gbaa okpotokpo.
GAL 6:12 Ọ bụ ndị na-achọ ka a hụ ha nʼanụ ahụ, bụ ndị ga-amanye unu ka e bie unu ugwu, naanị ihe ha ji eme otu a bụ ka a ghara ịkpagbu ha nʼihi obe Kraịst.
GAL 6:13 Ọ bụladị ndị kwere ka e bie ha ugwu, anaghị edebe iwu, kama ha chọrọ ka e bie unu ugwu ka ha nwee ike jiri ya nyaa isi nʼanụ ahụ.
GAL 6:14 Ka m gharakwa ịnya isi nʼihe ọbụla karịakwa nʼobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nke e sitere na ya kpọgbuo ụwa nʼebe m nọ, ma kpọgbukwaa mụ onwe m nʼebe ụwa nọ.
GAL 6:15 Obibi ugwu abụghị ihe, ebighị ugwu abụghịkwa ihe, kama ị bụ onye e kere ọhụrụ bụ ihe dị mkpa.
GAL 6:16 Ka udo na ebere dịnyere ndị niile na-ebi ndụ ha nʼusoro a, dakwasịkwa unu Izrel nke Chineke.
GAL 6:17 Site ugbu a gaa nʼihu, achọghị m ka onye ọbụla nye ndụ m nsogbu, nʼihi na-ebu m apa nke Jisọs nʼahụ m.
GAL 6:18 Ụmụnna m, ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
EPH 1:1 Akwụkwọ ozi a sitere nʼaka mụ onwe m bụ Pọl, onye Chineke họpụtara ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Ọ bụ unu ndị nsọ bi nʼEfesọs, unu bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼime Kraịst Jisọs, ka m na-edere ya:
EPH 1:2 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
EPH 1:3 Ka otuto dịrị Chineke, na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ onye gọziri anyị site nʼinye anyị ngọzị niile nke ime mmụọ nke si nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst.
EPH 1:4 Dịka o si họpụta anyị nʼime Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị bụrụ ndị dị nsọ na ndị na-enweghị ịta ụta nʼihu ya nʼịhụnanya.
EPH 1:5 O kpebiri ime anyị ụmụ ya site nʼihi Kraịst Jisọs. Ma o mekwara ihe ndị a niile nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ nʼobi, bụrụkwa ihe o zubere ime.
EPH 1:6 Ka e si otu a too ịdị ebube nke amara ya, nke o ji obi ya niile nye anyị nʼime Onye ahụ ọ hụrụ nʼanya.
EPH 1:7 Nʼime ya, anyị nwere mgbapụta site nʼọbara ya, bụ mgbaghara nke njehie niile anyị; dị ka ịba ụba nke amara ya si dị,
EPH 1:8 nke o mere ka ọ babigara anyị ụba oke site nʼamamihe na nghọta niile.
EPH 1:9 O meela ka anyị mata ihe omimi nzube ya, dị ka o si tọọ ya ụtọ, bụ ihe omimi o zubere ime nʼime Kraịst.
EPH 1:10 Nke ọ ga-eme ka o mezuo mgbe oge ya niile zuru, nke bụ ịchịkọta ihe niile nʼime ya, bụ ihe ndị dị nʼeluigwe na nʼụwa nʼokpuru Kraịst.
EPH 1:11 Nʼime Kraịst ka e mere anyị ndị nketa, ndị e bururị ụzọ họpụta na mbụ, dị ka atụmatụ onye ahụ na-arụpụta ihe niile nʼizuoke nke nzube na ebumnuche ya.
EPH 1:12 Nke mere na anyị, ndị buuru ụzọ nwee olileanya na Kraịst, ga-ebi ndụ nʼotuto nke ebube ya.
EPH 1:13 Unu bụkwa ndị a gụnyere nʼime Kraịst mgbe unu nụrụ ozi nke eziokwu ahụ bụ oziọma nke nzọpụta. Mgbe unu kwenyere, a kara unu akara nʼime ya bụ akara nke nkwa ahụ bụ Mmụọ Nsọ.
EPH 1:14 Nke a bụ ihe nketa anyị tutu ruo mgbe a rụzuru ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ niile bụ ihe nweta Chineke. Ka e si otu a too ebube ya.
EPH 1:15 Nʼihi nke a, ebe m nụrụ akụkọ banyere okwukwe unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, nụkwa maka ịhụnanya unu nwere nʼebe ndị nsọ niile nọ,
EPH 1:16 esepụghị m aka ikele ekele nʼihi unu, mgbe niile m na-echeta unu nʼekpere m niile.
EPH 1:17 Ana m arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube niile, ka o nye unu Mmụọ amamihe na ezi nghọta ka unu nwee ike matazie nke ọma onye ọ bụ,
EPH 1:18 ka o meghee anya nke ime mmụọ unu ka unu matakwa ụdị olileanya unu nwere nʼihi ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na akụ, na ihe nketa dị ebube o nwere nʼime ndị nsọ.
EPH 1:19 Na ịdị ukwuu nke ike ya nke na-enweghị atụ dịrị anyị, bụ ndị kwere ekwe, dịka ịrụsị ọrụ ike nke ike ya si dị.
EPH 1:20 Nke ọ rụrụ nʼime Kraịst mgbe o si nʼọnwụ kpọlite ya mee ya ka ọ nọdụ nʼaka nri ya nʼebe niile nke eluigwe.
EPH 1:21 Ọnọdụ ya dị elu karịa ọchịchị niile, na ikike ọchịchị niile, na ike niile na ịchị isi niile, na aha ọkwa ọchịchị nke e nwere ike inye mmadụ, ọ bụghị naanị nʼọgbọ a, kama ma nʼọgbọ ọzọ na-abịa.
EPH 1:22 O mere ka ihe niile dị nʼokpuru ya, meekwa ya ka ọ bụrụ onyeisi ihe niile nye nzukọ ya bụ chọọchị.
EPH 1:23 Nke bụ ahụ ya, ozuzu oke nke onye ahụ na-emejupụta ihe niile nʼụzọ niile.
EPH 2:1 Ma unu onwe unu, unu nwụrụ anwụ site na njehie ụzọ na mmehie unu.
EPH 2:2 Nke unu biri ndụ nʼime ha mgbe unu na-agbaso ụzọ niile nke ụwa a, na ụzọ onye ọchịchị nke alaeze ikuku, bụ mmụọ ahụ na-arụ ọrụ ugbu a na ndụ ndị ahụ na-enupu isi.
EPH 2:3 Anyị niile bikwara ndụ anyị nʼetiti ha, nʼoge gara aga, na-emejupụta agụụ nke anụ ahụ mmehie, ma na-agbaso ọchịchọ ya na ebumnuche ya. Nʼihi na site nʼọdịdị anyị, anyị na ndị ọzọ nọ nʼọmụma ikpe ya.
EPH 2:4 Chineke onye jupụtara nʼobi ebere, maka oke ịhụnanya o nwere nʼebe anyị nọ,
EPH 2:5 mere ka anyị soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ; ọ bụladị mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime ajọ omume. Ọ bụ site nʼamara ya ka e ji zọpụta unu.
EPH 2:6 Ọ kpọlitere anyị na ya, mee ka anyị nọdụ ọdụ nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst Jisọs.
EPH 2:7 O mere nke a igosi ọgbọ nke na-abịa, ịdị ukwuu nke akụ amara ya, nke o sitere nʼobiọma ya gosi anyị nʼime Kraịst Jisọs.
EPH 2:8 Nʼihi na ọ bụ site nʼamara ka e ji zọpụta unu site nʼokwukwe. Nke a abụghị ihe unu rụpụtara nʼonwe unu, ọ bụ onyinye nke Chineke.
EPH 2:9 O siteghị nʼọrụ, ka onye ọbụla ghara ịnya isi.
EPH 2:10 Nʼihi na anyị bụ akaọrụ ya, nke o kere nʼime Kraịst Jisọs nʼihi ịrụ ezi ọrụ. Ọ bụ otu a ka Chineke siri kwadoo na anyị kwesiri ibi ndụ ụbọchị niile.
EPH 2:11 Ya mere, chetanụ na nʼoge gara aga, unu bụ ndị mba ọzọ site nʼọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na “ndị e biri ugwu” na-akpọkwa unu “ndị a na-ebighị ugwu” (nʼihi obibi ugwu nʼanụ ahụ nke eji aka bie).
EPH 2:12 Nʼoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. E kewapụtara unu site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa nʼọgbụgba ndụ ahụ, na-enweghị olileanya na-enweghịkwa Chineke nʼime ụwa.
EPH 2:13 Ma ugbu a nʼime Kraịst Jisọs, unu bụ ndị nọ nʼebe dị anya nʼoge gara aga, ka e mere ka unu bịaruo nso site nʼọbara Kraịst nke a wụsiri.
EPH 2:14 Nʼihi na ya onwe ya bụ udo anyị, o mere ka ụzọ otu abụọ bụrụ otu ihe nʼime ahụ ya, site na ịkwatu mgbidi kewara ha na mgbe ochie, bụ mgbidi nke ịkpọ asị dị nʼetiti anyị.
EPH 2:15 Ọ bụ nʼime anụ ahụ ya ka ọ mere ka iwu ahụ na ụkpụrụ ya niile ghara ịdị ire. Ebumnobi ya bụ i kee nʼime onwe ya otu onye ọhụrụ site na mmadụ abụọ ahụ, si otu a mee ka udo dịrị.
EPH 2:16 Nʼụzọ dị otu a ka ọ ga-esi kpeziere anyị na Chineke site nʼobe ya, wetakwa nʼisi ngwụcha, iro dị nʼetiti ha abụọ.
EPH 2:17 Ya mere, ọ bịara kwusaa udo nye unu ndị nọ ebe dị anya na unu ndị nọ nso,
EPH 2:18 Nʼihi na anyị abụọ sitere nʼaka ya nweta nnabata anyị ịbịa nʼihu Nna site nʼotu Mmụọ ahụ.
EPH 2:19 Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ndị nsọ bụrụ diala na ndị so nʼezinaụlọ Chineke,
EPH 2:20 nke a rụkwasara nʼelu ntọala nke ndị ozi na ndị amụma, nke Kraịst Jisọs nʼonwe ya bụ nkume isi ntọala ya.
EPH 2:21 Ọ bụkwa nʼime ya ka a na-ejikọta ụlọ ahụ niile nke ọma, na-aba ụba, too bụrụ ụlọnsọ, nʼime Onyenwe anyị.
EPH 2:22 Onye a na-ewukọkwa unu onwe unu nʼotu nʼime ya, ka unu niile bụrụ ebe obibi Chineke nʼime Mmụọ.
EPH 3:1 Ọ bụ nʼihi nke a ka mụ onwe m bụ Pọl bụ onye mkpọrọ nke Jisọs Kraịst maka unu ndị mba ọzọ.
EPH 3:2 Nʼihi nʼezie, unu anụla banyere nlekọta nke amara Chineke ahụ nke e nyere m maka ọdịmma unu.
EPH 3:3 Otu e si kpughee nzube nzuzo ya niile nye m, dị ka m gwara unu ihe banyere ya nʼokwu dị nta nʼakwụkwọ ozi ahụ m detara unu.
EPH 3:4 Ọ bụrụkwa na unu agụọ akwụkwọ ahụ m deere, unu ga-aghọta ihe m maara banyere ihe omimi Kraịst.
EPH 3:5 Nke a e meghị ka ụmụ mmadụ mara nʼọgbọ gara aga dị ka Mmụọ Nsọ siri kpugheere ya ndị ozi na ndị amụma ya dị nsọ ugbu a.
EPH 3:6 Otu a ka ndị mba ọzọ si soro bụrụ ndị nketa, ndị ga-abụ otu anụ ahụ na ndị ga-eketa nkwa ahụ nʼime Jisọs Kraịst site nʼoziọma.
EPH 3:7 E mere m ka m bụrụ onyeozi nke oziọma a, dịka onyinye amara nke Chineke si dị, bụ nke e nyere m site nʼịrụ ọrụ nke ike ya.
EPH 3:8 Ọ bụ ezie na mụ bụ onye dịkarịsịrị nta nʼetiti ndị nsọ niile, e nyere m amara nke a, ikwusara ndị mba ọzọ oziọma banyere akụ nke enweghị atụ nke juru nʼime Kraịst,
EPH 3:9 meekwa ka mmadụ niile hụ ihe bụ atụmatụ nke ihe omimi e zoro nʼime Chineke onye kere ihe niile, ọtụtụ afọ.
EPH 3:10 Ka ọ ga-abụ site na chọọchị, a ga-eme ka amamihe Chineke nʼụdị dị iche iche bụrụ ihe ọchịchị na ikike niile dị nʼeluigwe ga-amata.
EPH 3:11 Nke a bụ nʼusoro nke atụmatụ ya dị ebighị ebi, nke e mezuru nʼime Jisọs Kraịst Onyenwe anyị,
EPH 3:12 bụ onye anyị nwere ntụkwasị obi na obi siri ike ịbịakwute site nʼokwukwe anyị nwere na ya.
EPH 3:13 Nʼihi nke a, arịọ m ka unu ghara ịda mba maka mkpagbu m nʼihi unu, ha bụ otuto nye unu.
EPH 3:14 Ọ bụ nʼihi nke a ka m na-egbu ikpere m nʼala nʼihu Nna anyị,
EPH 3:15 onye ezinaụlọ niile dị nʼụwa a na nke dị nʼeluigwe na-esite nʼaka ya enwe aha.
EPH 3:16 Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu;
EPH 3:17 ka Kraịst nwee ike biri nʼobi unu site nʼokwukwe, ka unu ndị gbanyere mgbọrọgwụ guzosiekwa ike nʼịhụnanya.
EPH 3:18 Ana m arịọkwa, ka unu na ndị nsọ niile nwee ike ịghọta ihe bụ obosara, ogologo, ịdị elu na ịdị omimi,
EPH 3:19 na ịmatakwa ịhụnanya nke Kraịst nke karịrị amamihe, ka unu jupụtakwa nʼizuoke niile nke Chineke.
EPH 3:20 Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ imebiga ihe nʼoke karịa ihe niile nke anyị rịọrọ, maọbụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nʼuche anyị, site nʼike ya nke na-arụ ọrụ nʼime anyị,
EPH 3:21 ọ bụ ya ka otuto dịrị nʼime chọọchị na nʼime Kraịst Jisọs ruo ọgbọ niile nke mgbe niile, ebighị ebi ruo ebighị ebi. Amen.
EPH 4:1 Ya mere, mụ onwe m bụ onye mkpọrọ nke Onyenwe anyị, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesiri ọkpụkpọ nke a kpọrọ unu.
EPH 4:2 Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya.
EPH 4:3 Nọọnụ nʼudo nʼetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nʼotu unu dịgide nʼime Mmụọ Nsọ.
EPH 4:4 E nwere otu ahụ na otu Mmụọ, dị ka e siri kpọọ unu nʼotu olileanya nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ unu.
EPH 4:5 Otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim.
EPH 4:6 Ọ bụkwa naanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe niile na onye na-achị ihe niile, na onye na-arụ ọrụ ya nʼime ihe niile, na-ebikwa nʼime ihe niile.
EPH 4:7 Ma e nyere onye ọbụla amara dịka oke onyinye nke Kraịst siri dị.
EPH 4:8 Nʼihi nke a, e kwuru, “Mgbe ọ rigoro gaa nʼelu, o duuru igwe ndị a dọtara nʼagha, nyekwa ụmụ mmadụ onyinye dị iche iche.”
EPH 4:9 (E kwuru, “Ọ rigoro,” gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụghị na o buru ụzọ rịdaa nʼime ala mmụọ?
EPH 4:10 Onye ahụ si nʼelu rịdata bụkwa otu onye ahụ rigoro nʼeluigwe, ka o nwee ike mejuo ihe niile.)
EPH 4:11 O nyekwara ụfọdụ onyinye ị bụ ndị ozi, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi.
EPH 4:12 Nke a bụ maka ikwadobe ndị nsọ maka ọrụ nke ije ozi, iji wulite ahụ nke Kraịst;
EPH 4:13 tutu anyị niile abịa na nkwekọta banyere okwukwe anyị, na ọmụma ihe banyere ọkpara Chineke, bụrụ onye tozuru oke, ruo ọtụtụ nke ogogo na ozuzu oke nke Kraịst.
EPH 4:14 Mgbe ahụ anyị agaghị abụkwa ụmụntakịrị, ndị ikuku ozizi ọhụrụ dị iche iche na-ebugharị ihu na azụ dị ka ebili mmiri, na ịgha ụgha nke mmadụ, bụ ozizi na-esite nʼime aghụghọ nke ha ji echepụta nduhie.
EPH 4:15 Kama nʼikwu eziokwu site na mmụọ ịhụnanya, anyị ga-eto bụrụ ndị tozuru oke nʼakụkụ niile nʼime ya, bụ onye ahụ bụ isi, nke bụ Kraịst.
EPH 4:16 Onye anụ ahụ niile, jikọtara ọnụ ma bụrụ otu, site na nkwonkwo niile nke na-enyezu ya nkwado, dịka akụkụ niile ọbụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite nʼụzọ ahụ enyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, nakwa iwuli ha elu site nʼịhụnanya.
EPH 4:17 Ya mere, ana m ekwu nke a, ma na-eguzokwa na ya nʼime Onyenwe, ka unu hapụ ibi ndụ dị ka ndị mba ọzọ si ebi, na echiche ha na-abaghị uru.
EPH 4:18 Ndị ọchịchịrị gbachiri nghọta ha. Ndị dị otu a enweghị oke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nʼihi na obi ha mechiri emechi, ha adịghị aghọtakwa.
EPH 4:19 Ha abụrụla ndị obi ha kpọrọ nkụ, ndị were onwe ha nyefee ime ihe niile masịrị ọchịchọ ha, ka ha si otu a na-ebi ndụ adịghị ọcha niile, ha bụ ndị jupụtara nʼanya ukwu.
EPH 4:20 Ma nke a abụghị otu unu siri mụta Kraịst,
EPH 4:21 ma ọ bụrụ na unu anụla ihe banyere ya, ọ bụrụkwa na unu amụtala ihe site nʼaka ya banyere eziokwu ahụ dị nʼime Jisọs.
EPH 4:22 Yipụnụ mmadụ ochie unu, nke mere ka unu na-ebi ndụ ọjọọ na mbụ, bụ mmadụ ochie ahụ nke jupụtara nʼagụụ ime ihe ọjọọ niile,
EPH 4:23 ka eme ka mmụọ nke uche unu dị ọhụrụ.
EPH 4:24 Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ.
EPH 4:25 Ya mere, wezuganụ ịgha ụgha, ka anyị niile kwuo eziokwu nye ndị agbataobi anyị, nʼihi na anyị niile bụ ndị e jikọtara nʼotu anụ ahụ.
EPH 4:26 Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe.
EPH 4:27 Enyela ekwensu ohere.
EPH 4:28 Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụọ ezi ọrụ, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.
EPH 4:29 Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị.
EPH 4:30 Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta.
EPH 4:31 Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu.
EPH 4:32 Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.
EPH 5:1 Ya mere bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ nʼanya.
EPH 5:2 Na-agakwanụ nʼime ịhụnanya, dịka Kraịst siri hụ anyị nʼanya ma were ndụ ya nye Chineke maka anyị dịka aja na onyinye nke isi ụtọ.
EPH 5:3 Ma nʼetiti unu, ka a ghara ịkpọta mmehie ịkwa iko, maọbụ nke adịghị ọcha, maọbụ nke inwe anya ukwu aha, nʼihi na ihe ndị a ekwesighị nʼetiti ndị nsọ.
EPH 5:4 Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ maọbụ okwu nzuzu maọbụ njakịrị, kama ka e nwee inye ekele.
EPH 5:5 Matanụ nke ọma na onye na-akwa iko, maọbụ onye rụrụ arụ, maọbụ onye anya ukwu, nʼihi na anya ukwu dị ka ikpere arụsị, enweghị ike ịbata nʼalaeze Kraịst na Chineke.
EPH 5:6 Unu ekwela ka onye ọbụla jiri okwu efu duhie unu. Ọ bụ nʼihi omume ọjọọ ndị a ka iwe Chineke ji abịakwasị ndị na-anaghị erubere ya isi.
EPH 5:7 Unu na ndị dị otu a enwela mmekọ.
EPH 5:8 Nʼihi nʼoge gara aga, unu bụ ọchịchịrị, ma ugbu a, unu bụ ìhè nʼime Onyenwe anyị. Na-ebinụ ndụ ka ụmụ nke ìhè
EPH 5:9 (nʼihi na a na-ahụ mkpụrụ nke ìhè nʼihe niile dị mma, na ihe ziri ezi, na eziokwu).
EPH 5:10 Gbalịanụ ịchọpụta ihe na-amasị Onyenwe anyị.
EPH 5:11 Unu etinyela aka nʼọrụ ọchịchịrị nke na-adịghị amị mkpụrụ ọbụla, kama gbaanụ ha nʼanwụ.
EPH 5:12 Ọ bụ ihe ihere ikwu okwu banyere ihe ndị a na-eme na nzuzo.
EPH 5:13 Mgbe a gbara ihe ọbụla nʼanwụ, ọ na-apụta ìhè nke ọma. Nʼihi na ihe ọbụla e mere ka ọ pụta ìhè nke ọma bụ ìhè.
EPH 5:14 Nke a mere na e kwuru, “Bilie gị onye na-arahụ ụra. Site nʼọnwụ bilie. Kraịst ga-emekwa ka ihe ya mụkwasị gị.”
EPH 5:15 Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.
EPH 5:16 Jirinụ ohere niile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nʼihi na ụbọchị ndị a dị njọ.
EPH 5:17 Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka unu mee,
EPH 5:18 Unu aṅụbigala mmanya oke nʼihi na ọ na-eduba na ndụ ịla nʼiyi. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ,
EPH 5:19 werenụ abụ ọma, na abụ nke ime mmụọ na-ekwe ukwe nʼetiti onwe unu. Werekwanụ obi unu niile na-abụrụ Onyenwe anyị abụ dị ụtọ.
EPH 5:20 Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
EPH 5:21 Na-edonụ onwe unu nʼokpuru ibe unu site nʼegwu Kraịst.
EPH 5:22 Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị.
EPH 5:23 Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya.
EPH 5:24 Ya mere, dị ka nzukọ si edo onwe ya nʼokpuru Kraịst, otu a ka ndị bụ nwunye kwesiri ido onwe ha nʼokpuru di ha nʼihe niile.
EPH 5:25 Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya.
EPH 5:26 O mere nke a ka o nwee ike doo ya nsọ, jirikwa okwu ya na ịsa mmiri nke baptizim mee ka ọ dị ọcha.
EPH 5:27 Ka o chee nzukọ nʼihu ya onwe ya dị ka ihe jupụtara nʼebube, nke na-enweghị ntụpọ, maọbụ ihu mgbarụ ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla dị otu a. Kama nke dị nsọ na-enweghị ịta ụta.
EPH 5:28 Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya.
EPH 5:29 Ọ dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, ọ na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị.
EPH 5:30 Nʼihi na anyị niile bụ akụkụ anụ ahụ ya.
EPH 5:31 “Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”
EPH 5:32 Nke a bụ ihe omimi dị ukwuu ma eji m ya atụnyere Kraịst na chọọchị ya.
EPH 5:33 Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.
EPH 6:1 Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị.
EPH 6:2 “Sọpụrụ nne gị na nna gị,” nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya.
EPH 6:3 “Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa.”
EPH 6:4 Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.
EPH 6:5 Ndị bụ ohu ruberenụ ndị nwee unu isi. Jirinụ nsọpụrụ na egwu na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ.
EPH 6:6 Ruberenụ ha isi, ọ bụghị naanị ka unu nata ihuọma ha mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama dị ka ndị ohu Kraịst, ndị na-eme uche Chineke site nʼobi ha.
EPH 6:7 Jirinụ ọṅụ na ihuọma rụọ ọrụ unu dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị mmadụ.
EPH 6:8 Nʼihi na unu maara na Onyenwe anyị ga-akwụghachi onye ọbụla maka ihe ọma ọbụla ha mere, ma ha bụ ohu maọbụ ndị nweere onwe ha.
EPH 6:9 Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nʼụzọ dị otu a. Abarala ha mba, nʼihi na ị matara na unu nwere naanị otu Nna ukwu nọ nʼeluigwe. Ile mmadụ anya nʼihu adịghịkwa nʼebe ọ nọ.
EPH 6:10 Nʼikpeazụ, dịnụ ike nʼime Onyenwe anyị na nʼime ike ya dị ukwuu.
EPH 6:11 Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu.
EPH 6:12 Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe.
EPH 6:13 Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha niile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ.
EPH 6:14 Meenụ ka eziokwu dịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike, ezi omume bụrụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu.
EPH 6:15 Werenụ njikere nke ikwusa oziọma nke udo yikwasị dị ka akpụkpọ nʼụkwụ unu.
EPH 6:16 Mgbe niile, unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ àkụ niile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nʼebe unu nọ.
EPH 6:17 Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu.
EPH 6:18 Ma kpeenụ ekpere nʼime Mmụọ nʼoge niile na ụdị ekpere na arịrịọ niile. Nọọnụ na njikere mgbe niile ma nọgidekwanụ na-ekpere ndị nsọ niile ekpere oge niile.
EPH 6:19 Na-echetakwanụ m nʼekpere, ka e nye m ike nke mkwuwa okwu, m ga-eji na-ekwupụta ihe omimi nke oziọma na-atụghị egwu ọbụla,
EPH 6:20 nke m ji maka ya bụrụ onye nnọchite anya nọ na mkpọrọ. Kperenụ m ekpere ka m kwupụta ya nʼatụghị egwu ọbụla dị ka m kwesiri ikwu.
EPH 6:21 Ugbu a, iji mee ka unu mara otu m dị na ihe m na-eme, Taịkikọs, nwanna m hụrụ nʼanya na nwaodibo kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị ga-akọrọ unu ihe niile.
EPH 6:22 Ana m ezitere ya unu nʼihi nke a, ka o mee ka unu mata ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa unu ume.
EPH 6:23 Ka udo na ịhụnanya, tinyere okwukwe nke sitere na Chineke Nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịịrị unu ụmụnna.
EPH 6:24 Ka amara dịnyere ndị niile ji ịhụnanya na-adịghị anwụ anwụ hụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼanya.
PHI 1:1 Pọl na Timoti, ndị bụ ohu Kraịst Jisọs, Na-edegara unu ndị ụkọchukwu, ndị okenye na ndị nsọ niile nọ nʼụlọ nzukọ Kraịst Jisọs dị nʼobodo Filipai.
PHI 1:2 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
PHI 1:3 Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu.
PHI 1:4 Nʼime arịrịọ niile m na-arịọ ya mgbe niile nʼekpere m nʼihi unu, obi m na-ejupụta nʼọṅụ.
PHI 1:5 Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a.
PHI 1:6 Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs.
PHI 1:7 Ọ bụ ihe ziri ezi nʼebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu niile, nʼihi na unu dị m nʼobi. Ma m nọ nʼagbụ maọbụ na m na-echekwa oziọma, na mgbe m na-eme ka o guzosie ike, unu niile esorola m keta oke nʼamara ahụ.
PHI 1:8 Chineke bụ onye akaebe m, otu agụụ unu niile si agụsi m ike site nʼịhụnanya nke Kraịst Jisọs.
PHI 1:9 Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile.
PHI 1:10 Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst.
PHI 1:11 Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto.
PHI 1:12 Ugbu a ụmụnna m, nke a bụ ihe m chọrọ ime ka unu ghọta, na nsogbu niile dakwasịrị m emeela ka ọrụ ikwusa oziọma na-aga nʼihu.
PHI 1:13 Nʼihi na ọ pụtala ihe nye ndị nche nke ụlọeze ahụ na onye ọbụla ọzọ, na ọ bụ naanị nʼihi na m bụ onye na-eso Kraịst ka e ji tụọ m mkpọrọ.
PHI 1:14 Site na mkpọrọ a a tụrụ m, e meela ka ọtụtụ ụmụnna anyị bụrụ ndị nwere ezi ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị, nwekwa oke nkwuwa okwu, izisa oziọma ahụ na-atụghị egwu ọbụla.
PHI 1:15 Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ji ekworo na anya ụfụ na-ekwusa Kraịst, ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nʼọchịchọ obi ziri ezi.
PHI 1:16 Ndị ahụ ji ọchịchọ obi ziri ezi na-eme nke a nʼịhụnanya ebe ha matara na e tinyere m ebe a nʼihi izisa oziọma.
PHI 1:17 Ndị mbụ ahụ na-ekwusa Kraịst site nʼọchịchọ obi nke onwe ha, ọ bụghị site nʼezi obi, ebe ha na-eche na ha ga-akpalị nsogbu nye m nʼime mkpọrọ.
PHI 1:18 Gịnịkwa ka ogbochiri? Otu ọ dị, maọbụ nʼụzọ aghụghọ maọbụ nʼeziokwu, ihe dị mkpa bụ nʼụzọ ọbụla a na-ekwusa oziọma Kraịst, nʼihi nke a ka m na-aṅụrị ọṅụ. E, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe niile.
PHI 1:19 Nʼihi na-amaara m na site nʼekpere unu, ya na ịgbaume nke Mmụọ Jisọs Kraịst ihe ndị a niile dakwasịrị m ga-emesi ghọọrọ m nzọpụta.
PHI 1:20 Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ.
PHI 1:21 Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru.
PHI 1:22 Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ nʼanụ ahụ, nke a buuru m ịrụpụta ọrụ bara uru, enweghị m ike ikwu nke m ga-ahọrọ.
PHI 1:23 Ụzọ ihe abụọ a na-eche m ihu: Ma ọchịchọ obi m bụ ịlakwuru Kraịst, nʼihi na ọ bụ nke kachasị mma.
PHI 1:24 Ma ọ pụtara ihe na ọ dị mkpa nye unu ma ọ bụrụ na m adịrị ndụ nʼanụ ahụ.
PHI 1:25 Ebe nke a doro m anya, amara m na mụ na unu niile ga-aga nʼihu ịnọ maka ọganihu na ọṅụ nke unu nʼime okwukwe.
PHI 1:26 Ka mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, unu ga-enwebiga ọṅụ oke nʼime Kraịst Jisọs nʼihi m.
PHI 1:27 Ma nʼọnọdụ ọbụla, na-ebinụ ndụ kwesiri oziọma nke Kraịst, ma abịara m leta unu maọbụ na abịaghị m, ka a mata na unu guzosiri ike nʼotu mmụọ, werekwa otu obi na-agba mgba nʼokwukwe nke ikwusa oziọma,
PHI 1:28 na-atụghị ụjọ ihe ndị na-emegide unu ga-eme. Iguzosi ike unu ga-agbara ha ezi ama banyere ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha. Ma nʼebe unu nọ, ọ ga-abụrụ unu nzọpụta pụtara ihe nke sikwa nʼebe Chineke nọ bịa.
PHI 1:29 Nʼihi na ohere ahụ e nyere unu, abụghị naanị ikwere na Kraịst, kama ọ bụkwa ịhụ ahụhụ nʼihi ya.
PHI 1:30 Unu nọ na-agabiga ụdị ibu agha ahụ unu hụrụ na m gabigara, nke unu na-anụkwa na m ka nọ nʼime ya ugbu a.
PHI 2:1 Ya mere, ọ bụrụ na e nwere nkasiobi ọbụla dịrị anyị nʼihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere inyeaka ọbụla site nʼịhụnanya ya, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọbụla anyị na Mmụọ na-enwekọ, ọ bụrụ na unu nwere obi nro na ọmịiko,
PHI 2:2 meenụ ka ọṅụ m zuo oke, site nʼinwe nkwekọta nʼihe ọbụla, site nʼịhụrịta onwe unu nʼanya, sitekwa nʼinwekọ otu mmụọ, na otu uche.
PHI 2:3 Emela ihe ọbụla nʼihi naanị ọdịmma nke gị, maọbụ bie ndụ nʼụzọ ịdọtara onwe gị otuto efu. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye na-ahụ ndị ọzọ dị ka ndị ka ya mma.
PHI 2:4 Echela echiche banyere naanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya nʼihe banyere ndị ọzọ.
PHI 2:5 Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst:
PHI 2:6 Onye ọ bụ ezie na o nwere ụdịdị Chineke site na mmalite ma ọ gụghị ụdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike.
PHI 2:7 Kama, ọ gụrụ onwe ya dị ka ihe efu, site na ịnara ụdịdị nke onye bụ ohu, onye nke a mụrụ dị ka mmadụ.
PHI 2:8 Ebe ahụrụ ya ka ọ dịka mmadụ nʼoyiyi, o wedakwara onwe ya ala, site nʼirube isi ruo ọnwụ, bụ ọnwụ nke obe.
PHI 2:9 Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu.
PHI 2:10 Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa.
PHI 2:11 Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.
PHI 2:12 Ya mere, ezi ndị enyi m, dị ka unu na-erube isi mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe m nọ, ma karịsịa ugbu a m na-anọghị unu nso, gaanụ nʼihu ịrụpụta nzọpụta unu site nʼịtụ egwu na ịma jijiji.
PHI 2:13 Nʼihi na ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ nʼime unu, inyere unu aka ịchọ ime ihe ọ chọrọ ka unu mee, na inyere unu aka ime ihe ahụ ọ chọrọ.
PHI 2:14 Nʼihe ọbụla unu na-eme, wezuganụ ntamu na ịrụ ụka nʼetiti unu.
PHI 2:15 Bienụ ndụ unu dị ka ụmụ Chineke, ndị a na-apụghị ịta ụta, ndị dị ọcha na ndị a na-apụghị ibo ebubo nʼime ụwa ọjọọ a, nʼetiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, na nʼetiti ndị nwere obi nʼazụ. Mgbe ahụ, unu ga-enwupụta nʼetiti ha dị ka kpakpando nʼime ụwa!
PHI 2:16 Na-echekwanụ nʼihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na ọrụ m rụrụ nʼetiti unu abụghị ihe efu.
PHI 2:17 Nʼezie, ọ bụrụ na-awụpụ m dị ka aja ihe ọṅụṅụ nʼelu aja nʼife ofufe nke sitere na Chineke nʼihi okwukwe unu. E, a si na e gbuo m nʼihi unu, aga m aṅụrị ọṅụ na-esorokwa unu niile nwe obi ụtọ
PHI 2:18 otu aka ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe obi ụtọ ma sorokwa m ṅụrịa ọṅụ.
PHI 2:19 Enwere m olileanya nʼime Onyenwe anyị Jisọs na m ga-ezitere unu Timoti nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, ka m site nʼozi ọ ga-anata banyere unu nwee obi ụtọ.
PHI 2:20 Enweghị m onye ọzọ dị ka ya, onye ga-eche ezi echiche maka ọdịmma unu.
PHI 2:21 Nʼihi na ndị ọzọ na-echegbu onwe ha maka ọdịmma nke ha, ma ọ bụghị maka ọdịmma Jisọs Kraịst.
PHI 2:22 Ma unu niile maara otu Timoti si dị oke mkpa. Ọ dị nnọọ dị ka nwa m, site nʼinyeaka ọ na-enyere m nʼọrụ izisa oziọma.
PHI 2:23 Enwere m olileanya nʼezie izitere unu ya. M ga-emekwa nke a ma ọ bụrụ na m chọpụta ihe ọnọdụ m nʼebe a ga-abụ.
PHI 2:24 Nʼezie, enwere m olileanya na site nʼinyeaka Onyenwe anyị, mụ onwe m ga-abịakwutekwa unu na mgbe na-adịghị anya.
PHI 2:25 Otu ọ dị, echere m na ọ dị mkpa ugbu a izighachiri unu Epafroditọs, nwanna m na onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, onye mụ na ya na-ebukọ agha, onyeozi nke unu zitere ka ọ bịa nyere m aka nʼọnọdụ mkpa m.
PHI 2:26 Ugbu a, ana m eziteghachiri unu ya, nʼihi na ọ na-agụsị ya agụụ ike ịhụ unu anya. O wutekwara ya nke ukwuu, na e mere ka unu mara na ọ dara ọrịa nʼoge gara aga.
PHI 2:27 Nʼezie, ọ fọdụrụ nnọọ ntakịrị ka o site nʼọrịa ahụ daa nʼụra ọnwụ. Ma Chineke meere ya ebere. Ọ bụghị naanị ya, kama o mekwaara m ebere, nʼihi na o kweghị ka a tụkwasịrị m ihe mwute nʼelu ihe mwute.
PHI 2:28 Nʼihi nke a, ọ na-anụ m ọkụ nʼobi izite ya nʼebe unu nọ. Nʼihi na amaara m na ọbịbịa ọ ga-abịakwute unu ga-eme ka unu ṅụrịa ọṅụ. Ọ ga-emekwa ka ọnọdụ nchegbu m dị mfe.
PHI 2:29 Ya mere, arịọ m unu, werenụ ọṅụ nabata ya nke ọma nʼime Onyenwe anyị, na-asọpụkwaranụ ndị dị ka ya.
PHI 2:30 Nʼihi na ọ fọdụrụ nwantịị ka o nwụọ, nʼihi ọrụ nke Kraịst, tinye ndụ ya nʼihe egwu iji mezuo ọrụ unu nʼebe m nọ.
PHI 3:1 Na nchịkọta okwu ndị a niile, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Ike adịghị agwụ m ịgwa unu ihe ndị a. Ọ bakwaara unu uru ịnụ ụdị okwu a mgbe niile.
PHI 3:2 Kpachapụrụnụ onwe unu anya nʼebe ndị mmadụ ọjọọ ahụ yiri nkịta nọ. Ndị ahụ na-eyiwasị ahụ ha.
PHI 3:3 Nʼihi na ọ bụ anyị bụ ndị ezi obibi ugwu ahụ, ọ bụghị ha, nʼihi na anyị bụ ndị na-efe Chineke site na Mmụọ ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime Kraịst Jisọs. Anyị adịghị atụkwasị obi nʼihe e mere nʼanụ ahụ.
PHI 3:4 Mụ onwe m nwere ike nwee ntụkwasị obi nʼihe ndị a. Nʼihi na e nwee onye chere na ọ pụrụ ịtụkwasị obi ya nʼanụ ahụ, mụ onwe m nwere ụdị ntụkwasị obi ahụ karịa onye ahụ:
PHI 3:5 e biri m ugwu nʼabalị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, abụ m onye Izrel, sitere nʼagbụrụ Benjamin; abụ m onye Hibru a mụrụ nʼetiti ndị Hibru; dị ka o si metụta iwu abụ m onye Farisii;
PHI 3:6 igosi ịnụ ọkụ nʼobi m, akpagburu m chọọchị, nʼụzọ ezi omume nʼokpuru iwu, abụ m onye zuruoke.
PHI 3:7 Ma ihe ndị a niile m gụrụ dịka ihe bara uru nʼoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru nʼihi Kraịst.
PHI 3:8 E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru.
PHI 3:9 Ka e nwee ike hụ m nʼime ya. Enweghị m ezi omume nke aka m, nke dabere nʼiwu, kama ọ bụ nke sitere nʼokwukwe na Kraịst, ezi omume si na Chineke nke dabeere nʼokwukwe.
PHI 3:10 Naanị ihe m chọrọ bụ ịmara Kraịst na ike dị na mbilite nʼọnwụ ya, na nnwekọ nke isoro ya keta oke nʼahụhụ ya, nakwa ka m yie ya nʼọnwụ.
PHI 3:11 Ka m si otu a, ruo nʼogo nke inweta mbilite site nʼọnwụ.
PHI 3:12 Anaghị m ekwu na m etozuola oke, maọbụ nwezuo ihe niile. Ma a na m agbalịsi ike ka m jide ihe ahụ nke Kraịst Jisọs jidere m nʼihi ya.
PHI 3:13 Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu.
PHI 3:14 Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst.
PHI 3:15 Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. Ọ bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a.
PHI 3:16 Ka anyị jidesienụ aka ike naanị nʼihe ahụ anyị nweterela.
PHI 3:17 Ụmụnna m, na-agbasonu ụdị ndụ m na-ebi, chọpụtakwanụ ndị ọzọ na-adị ndụ dị ka anyị si adị, mee ha ihe ilere anya unu.
PHI 3:18 Nʼihi na agwala m unu nke a ọtụtụ mgbe, na-achọkwa ịgwa unu ya ọzọ ugbu a. Lee, anya mmiri dị m nʼanya ugbu a m na-ekwu ya sị na e nwere ọtụtụ ndị na-ebi ndụ ha dị ka ha bụ ndị iro obe Kraịst nʼezie.
PHI 3:19 Ọgwụgwụ ndị dị otu a ga-abụ ịla nʼiyi. Afọ ha bụ chi ha, ndị otuto ha dịkwa nʼihere ha. Ha na-atụkwasị uche naanị nʼihe nke ụwa.
PHI 3:20 Ma ebe obibi anyị dị nʼeluigwe, ebe anyị na-atụsi anya ike na Onye nzọpụta bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-esi bịa.
PHI 3:21 Onye ga-agbanwe ahụ anyị dị ala ka ọ dị ka nke ya dị ebube, site nʼike nke mere ka o debe ihe niile nʼokpuru ya.
PHI 4:1 Ya mere, ụmụnna m, ndị m hụrụ nʼanya, na ndị ihe ha na-agụsị m agụụ ike, unu ndị na-enye m ọṅụ, na ndị bụ okpueze m nʼihi ọrụ m na-arụ, bikonu, guzosienụ ike nʼime Onyenwe anyị.
PHI 4:2 Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, nwe otu uche nʼime Onyenwe anyị.
PHI 4:3 E, ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, biko, nyere ụmụ nwanyị ndị a aka nʼihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa oziọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ.
PHI 4:4 Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile nʼime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ!
PHI 4:5 Meenụ ka mmadụ niile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obiọma nʼihe niile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.
PHI 4:6 Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.
PHI 4:7 Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.
PHI 4:8 Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya.
PHI 4:9 Na-emenụ ihe ọbụla unu si nʼaka m mụta, maọbụ ihe unu nụrụ, ma ọ bụkwanụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.
PHI 4:10 Ana m aṅụrị ọṅụ dị ukwuu nʼime Onyenwe anyị nʼihi na unu mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Unu bu m nʼobi nʼeziokwu ma unu enwetaghị ohere izipụta ya.
PHI 4:11 Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla.
PHI 4:12 Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ.
PHI 4:13 Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.
PHI 4:14 Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nʼọnọdụ nsogbu nke m nọ nʼime ya.
PHI 4:15 Unu onwe unu ndị Filipai maara na mbido nke oziọma a, mgbe m hapụrụ Masidonia, na o nweghị nzukọ ọzọ nyere m aka nʼinye maọbụ ịnabata onyinye, ma e wezuga unu.
PHI 4:16 Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m.
PHI 4:17 Ọ bụghịkwa na m chọrọ onyinye unu, kama ana m achọ ka mkpụrụ unu ga-amịta baa ụba, bara unu uru.
PHI 4:18 Ugbu a, enweela m ihe niile na-akpa m mkpa, nʼezie, enweela m karịa ihe na-akpa m. Onyinye unu nyere m, nke Epafroditọs wetara, egboola mkpa m niile. Onyinye ndị a dị ka aja na-esi isi ụtọ a chụụrụ Chineke, nke ọ na-anabatakwa nke ọma.
PHI 4:19 Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs.
PHI 4:20 Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
PHI 4:21 Keleere m ndị nsọ niile nʼime Kraịst Jisọs. Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekelekwa unu.
PHI 4:22 Ndị nsọ niile nọ nʼebe a na-ekele unu, karịsịa ndị nọ nʼụlọ Siza.
PHI 4:23 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
COL 1:1 Pọl, onye e mere onyeozi Kraịst Jisọs, site nʼọchịchọ Chineke, ya na nwanna anyị Timoti,
COL 1:2 Na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị, bụ ụmụnna ndị dị nsọ na ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị dịrị unu.
COL 1:3 Mgbe ọbụla anyị na-ekpere unu ekpere anyị na-ekele Chineke onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele.
COL 1:4 Nʼihi na anyị anụla ihe banyere okwukwe unu nʼime Kraịst Jisọs, na otu unu si hụ ndị nsọ niile nʼanya.
COL 1:5 Okwukwe na ịhụnanya nke na-esite nʼolileanya nke a kwadobere unu nʼeluigwe, nke unu nụrụla nʼokwu nke eziokwu ahụ, bụ oziọma,
COL 1:6 nke bịaruterela unu. Nʼezie, dị ka o si dị nʼụwa niile, ọ na-amị mkpụrụ na-etokwa, dị ka o si eme nʼetiti unu, site nʼụbọchị unu nụrụ ma ghọtakwa amara nke Chineke nʼeziokwu.
COL 1:7 Dị ka unu siri mụta nʼaka Epafras, onye anyị hụrụ nʼanya na onye anyị na ya na-ejekọ ozi. Ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼijere Kraịst ozi nʼaha unu.
COL 1:8 O meela ka anyị mara ụdị ịhụnanya unu nwere nʼime Mmụọ.
COL 1:9 Nʼihi nke a, site nʼụbọchị anyị nụrụ ihe banyere ya, anyị esepụghị aka ikpere unu ekpere. Anyị na-arịọ ka unu jupụta nʼamamihe nke uche ya, nʼime nghọta ma amamihe nke mmụọ niile.
COL 1:10 Ka unu si otu a bie ndụ dị ka Onyenwe anyị chọrọ. Ka unu bụrụkwa ndị na-eme ihe ọma mgbe niile, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ nʼụzọ ọbụla, na ndị na-eto eto nʼihe banyere ịma Chineke mgbe niile.
COL 1:11 Ebe a na-eme ka unu dị ike nʼime ike niile, dị ka ike nke ebube ya si dị. Ka unu nwee ndidi na ogologo ntachiobi,
COL 1:12 na-enyenụ Nna ekele site nʼọṅụ, onye mere ka anyị kwesi iketa oke nʼihe nketa nke ndị nsọ nʼime alaeze nke ìhè.
COL 1:13 Nʼihi na ọ napụtara anyị site nʼike nke ọchịchịrị, bịa kpọfee anyị nʼalaeze nke Ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya.
COL 1:14 Onye anyị si nʼime ya nwee nzọpụta, nke bụ mgbaghara mmehie niile.
COL 1:15 Ọ bụ nnọọ onyinyo Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya, bụrụkwa onye mbụ a mụrụ nʼihe niile e kere eke.
COL 1:16 Nʼihi na nʼime ya ka e ji kee ihe niile dị nʼụwa na nke dị nʼeluigwe, na ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya, ma ocheeze niile, ike niile, ịchị isi niile na ike ọchịchị niile. E kere ihe niile site nʼaka ya nakwa nʼihi ya.
COL 1:17 Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, ọ bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu.
COL 1:18 Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị. Ọ bụ ya bụ mmalite, onye mbụ a mụrụ nʼetiti ndị niile ga-esi nʼọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nʼime ihe niile.
COL 1:19 Nʼihi na ọ bụ nʼime ya ka ọ masịrị ozuzu oke ya ibi.
COL 1:20 Ọ bụ site na ya ka o ji mee ka ihe niile bịaghachikwute ya. E mere ka udo dịrị nʼetiti ya na ihe niile, maọbụ ihe dị nʼụwa, maọbụ nke dị na nʼeluigwe site na ọbara ọ wụsiri nʼelu obe.
COL 1:21 Unu onwe unu bụ ndị e mere ndị mba ọzọ site nʼebe Chineke nọ, na ndị iro nʼuche unu nʼihi ajọ omume niile unu.
COL 1:22 Ma ugbu a, o kpezierela unu site na-anụ ahụ Kraịst, sitekwa nʼọnwụ ya, iji chee unu nʼihu ya dịka ndị dị nsọ, na ndị na-enweghị ịta ụta, na ihe ebubo ọbụla megide ha.
COL 1:23 Ma ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwukwe unu, bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ, ndị guzosiri ike, ndị na-ewezugaghị onwe ha site nʼolileanya ahụ dịrị unu nʼoziọma ahụ. Nke a bụ oziọma ahụ unu nụrụ, nke ekwusakwara nye ihe niile e kere eke nʼokpuru eluigwe, nke e mere mụ onwe m bụ Pọl, onyeozi ya.
COL 1:24 Ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi ahụhụ ndị a nke m na-ahụ nʼihi unu, ana m emezu ihe fọdụrụ nʼahụhụ ahụ Kraịst tara nʼihi anụ ahụ ya bụ chọọchị.
COL 1:25 Emeela ka m bụrụ onyeozi chọọchị ya site nʼikike Chineke nyere m, ikwusara unu okwu Chineke nʼozuzu oke ya.
COL 1:26 Nke bụ ihe omimi ahụ, nke e zoro ezo site nʼoge ahụ nakwa ọgbọ niile ndị a gara aga, ma ugbu a e mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị nsọ Chineke.
COL 1:27 Ọ bụ ha ka Chineke họpụtara ime ka amata akụ nke ebube nke ihe omimi a nʼetiti ndị mba ọzọ, nke bụ Kraịst nʼime unu, onye bụ olileanya nke ebube ahụ.
COL 1:28 Ọ bụ ya ka anyị na-ekwusa, na-adụ onye ọbụla ọdụ, na-akụzikwara onye ọbụla ihe site nʼamamihe niile. Nʼihi na anyị chọrọ iche mmadụ niile ọbụla nʼihu ya dị ka ndị zuruoke nʼime Kraịst.
COL 1:29 Nʼihi nke a ka m na-adọgbu onwe m nʼọrụ, dị ka ike ya dị ukwuu nke na-arụ ọrụ si dị m nʼime.
COL 2:1 Ọ bụ ọchịchọ m ka unu ghọta otu m si na-agbasi mgba ike nke ukwuu nʼihi unu, na nʼihi ndị nọ nʼobodo Laodisia, na ndị niile na-enwebeghị ike ịhụ m ihu na ihu.
COL 2:2 Ebumnobi m bụ ka a gbaa ha ume, jikọọkwa ha nʼotu nʼịhụnanya, ka ha nweta ụba niile nke nghọta zuruoke na amamihe nke ihe omimi Chineke ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya.
COL 2:3 Ọ bụkwa nʼime ya ka ụlọakụ ihe zoro ezo niile nke amamihe na ihe ọmụma dị.
COL 2:4 Ana m ekwu nke a ka onye ọbụla ghara iji ire ụtọ duhie unu ụzọ.
COL 2:5 Ọ bụ ezie na anọghị m nʼetiti unu nʼanụ ahụ, ma anọ m nʼetiti unu nʼime mmụọ. Ana m aṅụrị ọṅụ ịhụ mkpebi unu na iguzosi ike nʼokwukwe unu nʼime Kraịst.
COL 2:6 Ya mere, dị ka unu si nabata Kraịst Jisọs Onyenwe anyị, na-ebinụ ndụ unu nʼime ya.
COL 2:7 Bụrụnụ ndị mgbọrọgwụ ha mibanyere nʼime ya, ndị a na-ewuli elu nʼime ya, ndị dị ike nʼime okwukwe, dị ka e si kuziere unu, ndị jupụtara na-inye ekele.
COL 2:8 Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iji ozizi na amamihe efu niile nke na-achị ụwa, na aghụghọ duhie unu nʼokwukwe. Okwu amamihe ahụ nke ihe ozizi ya na ọsịsa ya niile dabeere na mmụọ nke ụwa na ntụpụta mmadụ kama ịdabere nʼihe Kraịst kwuru.
COL 2:9 Nʼihi na nʼime Kraịst ka izuoke niile nke Chineke bi nʼụdịdị mmadụ.
COL 2:10 Ya mere, unu nwere ihe niile nʼime ya, onye bụ isi ndị niile na-achị achị, onye bụkwa isi nʼebe ike na ịchị isi niile dị.
COL 2:11 Nʼime ya, e biri unu ugwu nke ejighị aka bie, site nʼiwepụ ọdịdị anụ ahụ nʼobibi ugwu nke Kraịst biri.
COL 2:12 Mgbe e likọtara unu na ya na baptizim, e sitere nʼọnwụ kpọlite unu na ya site nʼokwukwe ahụ dị nʼike Chineke onye sitere nʼọnwụ kpọlite ya.
COL 2:13 Mgbe unu bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime mmehie unu, na nʼime ebighị ugwu nke anụ ahụ mmehie unu, Chineke mere ka unu soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ. Ọ gbaghara anyị mmehie anyị niile,
COL 2:14 kagbuo iwu niile e dere ede, ya na usoro ya niile nke guzoro imegide anyị. O wezugara ha, kpọgide ha nʼobe.
COL 2:15 Mgbe ọ napụrụ ike niile, na ịchị isi niile, ngwa agha ha niile, ọ gbara ha ọtọ nʼihu ọha, igosi mmeri o meriri ha nʼobe.
COL 2:16 Nʼihi ya, unu ekwela ka onye ọbụla kpee unu ikpe banyere ihe ọbụla unu na-eri, maọbụ ihe unu na-aṅụ, maọbụ ihe banyere ido ụbọchị nsọ, maọbụ ime mmemme ọnwa ọhụrụ maọbụ mmemme ụbọchị izuike.
COL 2:17 Ihe ndị a niile bụ onyinyo nke ihe ga-abịa nʼọdịnihu ma nke pụtara ihe dị nʼime Kraịst.
COL 2:18 Unu ekwela ka onye ọbụla nke ọ na-amasị ife ndị mmụọ ozi maọbụ ibi ndụ umeala nke aghụghọ dị nʼime ya, onye na-ekwu ọtụtụ okwu banyere ọhụ ọ hụrụ, si otu a na-afụli onwe ya elu nʼefu nʼihi echiche nke onwe ya, maa unu ikpe ma napụ unu ihe nrite unu.
COL 2:19 Onye na-adịghị ejidesikwa onye bụ isi aka ike, onye a na-esite nʼaka ya na-eme ka ahụ niile, nke nkwonkwo ha na akwara ha niile na-ejikọta nʼotu, too eto dị ka Chineke si chọọ ka ha too.
COL 2:20 Ebe ọ bụ na unu esorola Kraịst nwụọ nʼebe ozizi na amamihe niile nke na-achị ụwa nọ, gịnị mekwaranụ unu ji ka na-ebi ndụ dị ka a ga-asị na unu bụ nke ụwa, gịnị mere unu ji na-edo onwe unu nʼokpuru iwu ya dị iche?
COL 2:21 “Ejidela nke a aka, edetụla nke a ire, ebitụkwala nke a aka”?
COL 2:22 Iwu ndị a niile na-ekwu banyere ihe ndị ga-ala nʼiyi mgbe a na-etinye ha nʼọrụ, ha sitere nʼiwu na ozizi nke mmadụ.
COL 2:23 Nʼezie, iwu ndị a yiri ihe e ji amamihe guzobe, nʼihi ụzọ o si akwali mmụọ mmadụ nʼife ofufe dị ka ọ chọrọ, na iweda onwe nʼala, na ịta anụ ahụ ahụhụ. Ma ha abaghị uru o bụla iji ha gbochie agụụ ọjọọ nke anụ ahụ.
COL 3:1 Ya mere, ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nʼọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nʼihe dị nʼeluigwe ebe Kraịst nọ nʼakụkụ aka nri Chineke.
COL 3:2 Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nʼụwa.
COL 3:3 Nʼihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nʼime Chineke site na Kraịst.
COL 3:4 Mgbe Kraịst onye bụ ndụ unu ga-apụta ihe, unu ga-esokwa ya pụta ìhè nʼebube ya.
COL 3:5 Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị).
COL 3:6 Ọ bụkwa nʼihi ihe ndị a ka ọnụma Chineke na-abịakwasị ndị ahụ na-enupu isi.
COL 3:7 Ihe ndị a bụ ihe unu na-eme nʼoge gara aga mgbe unu na-adị ndụ nʼime ha.
COL 3:8 Ma ugbu a bụ oge iwezuga ihe ndị a niile na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu niile, ya na okwu ihere niile na-esi unu nʼọnụ na-apụta.
COL 3:9 Unu agwala ibe unu okwu ụgha, nʼihi na unu eyipụla mmadụ ochie ahụ na-eme ụdị omume a.
COL 3:10 Ugbu a, unu eyikwasịla ndụ ọhụrụ ahụ, nke e ji amamihe na-eme ka ọ dị ọhụrụ nʼoyiyi nke onye kere ya.
COL 3:11 Nkewa ọbụla adịghị nʼime ndụ a. Ọ dịghị mkpa maọbụ onye Juu maọbụ onye mba ọzọ, maọbụ onye e biri ugwu, maọbụ onye a na-ebighị ugwu. Ọ dịkwaghị mkpa maọbụ onye na-asụ asụsụ ọzọ, ma ọ bu onye ime ọhịa, maọbụ onye Sitia, maọbụ ohu, ma ọ bụkwanụ onye nwe onwe ya. Ihe dị mkpa bụ na Kraịst bụ ihe niile, nọrọkwa nʼime ihe niile.
COL 3:12 Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi.
COL 3:13 Na-anagidenụ ibe unu, gbagharakwa mmejọ ọbụla ibe unu na-emejọ unu. Gbagharanụ dị ka Onyenwe anyị sị gbaghara unu.
COL 3:14 Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na ọ bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu.
COL 3:15 Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele.
COL 3:16 Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.
COL 3:17 Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya.
COL 3:18 Ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu, dị ka ọ kwesiri ime nʼime Onyenwe anyị.
COL 3:19 Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume.
COL 3:20 Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.
COL 3:21 Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.
COL 3:22 Ndị bụ ohu, na-eruberenụ ndị bụ nna unu ukwu nʼanụ ahụ isi nʼihe niile, na-emenụ nke a, ọ bụghị naanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, maọbụ mgbe unu chọrọ ịnata ihuọma, kama werenụ obi unu niile, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rubere ha isi.
COL 3:23 Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.
COL 3:24 Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Onyenwe anyị kwadobere inye unu, ndị ya. Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị Kraịst ka unu na-ejere ozi.
COL 3:25 Onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ ga-anata ụgwọ ọrụ nʼihi ihe ọjọọ niile o mere. Nʼihi na ile mmadụ anya nʼihu adịghị ya.
COL 4:1 Unu ndị nwe odibo, jirinụ ịkwụba aka ọtọ na ikpe ziri ezi na-emeso ndị ohu unu omume, ebe unu maara na unu onwe unu nwere onyenwe unu nʼeluigwe.
COL 4:2 Na-anọgidenụ nʼekpere, nọọkwanụ na nche na-enyekwanụ ekele.
COL 4:3 Na-echetakwanụ anyị nʼekpere, ka Chineke meghere anyị ụzọ ikwusa oziọma, ka anyị nwee ike kwusaa ihe omimi Kraịst, nke m ji maka ya nọrọ nʼụlọ mkpọrọ,
COL 4:4 ka m nwee ike kwuo ya ka o doo anya otu m kwesiri.
COL 4:5 Unu were amamihe na-achịkọta onwe unu nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, jizienụ ohere ọbụla unu nwere nke ọma.
COL 4:6 Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.
COL 4:7 Taịkikọs, ezi nwanna anyị, onye kwesikwara ntụkwasị obi, onye anyị na ya na-ejekọ ozi nʼọrụ Onyenwe anyị, ga-akọrọ unu ihe niile banyere m.
COL 4:8 Ana m ezitere unu ya, ka unu mara ihe banyere ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa obi unu ume.
COL 4:9 Ezi nwanna anyị nwoke bụ Onisimọs, onye kwesiri ntụkwasị obi, onye bụkwa otu nʼime unu, so ya na-abịa. Ha ga-agwa unu ihe niile na-eme nʼebe a.
COL 4:10 Arịstakọs, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ, na-ekele unu. Mak nwanne Banabas na-ekelekwa unu. (Onye unu natara ihe ntụziaka banyere ya, ọ bụrụ na ọ bịarute nʼebe unu nọ, unu nabata ya nke ọma.)
COL 4:11 Jisọs, onye a na-akpọkwa Jọstus, na-ekelekwa unu. Ọ bụ naanị ndị a bụ ndị Juu mụ na ha na-arụkọ ọrụ alaeze Chineke nʼebe a. Ha na-eme nnọọ nke ọma, na-enye m obi ụtọ.
COL 4:12 Epafras, odibo Kraịst Jisọs na onye bụkwa otu onye nʼime ọgbakọ unu na-ekele unu. Oge niile ka ọ na-ekpe ekpere nʼihi unu, na-arịọ ka unu guzosie ike bụrụ ndị tozuru etozu na ndị kwesiri ike nʼọchịchọ niile nke Chineke.
COL 4:13 Ana m agbara ya akaebe na ọ rụsịrị ọrụ ike nʼihi unu na nʼihi ndị Laodisia na ndị Hierapolis.
COL 4:14 Ezi enyi anyị Luk, onye dibịa ukwu anyị na Dimas na-ekele unu.
COL 4:15 Keleerenụ m ụmụnna anyị bi na Laodisia na nwanna anyị Nimfas na chọọchị na-ezukọ nʼụlọ ya.
COL 4:16 Mgbe unu gụchara akwụkwọ a, hụnụ na a gụkwara ya na nzukọ dị na Laodisia. Gụọkwanụ nʼotu mgbe ahụ akwụkwọ nke si na Laodisia bịa.
COL 4:17 Gwanụ Akipos ka ọ kpachapụ anya rụchaa ọrụ Onyenwe anyị nyere ya ịrụ.
COL 4:18 Eji m aka m dee ekele nke a mụ onwe m bụ Pọl. Unu echefula na m nọ nʼagbụ. Ka amara dịnyere unu.
1TH 1:1 Akwụkwọ ozi a si nʼaka Pọl, Saịlas na Timoti. Na-abịara nzukọ dị na Tesalonaịka, ndị e jikọtara ha na Chineke Nna, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka amara na udo dịrị unu.
1TH 1:2 Anyị na-ekele Chineke ekele mgbe niile, na-echetakwa unu nʼekpere anyị.
1TH 1:3 Mgbe niile ka anyị na-echeta nʼekpere nye Chineke bụ Nna, ihe gbasara ọrụ unu nke sitere nʼokwukwe, ya na ịrụsị ọrụ ike unu nke sitere nʼịhụnanya, na iguzosi ike unu nke sitere nʼolileanya unu nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
1TH 1:4 Ụmụnna anyị, anyị maara na Chineke hụrụ unu nʼanya nke ukwuu, họpụta unu.
1TH 1:5 Nʼihi na ọbụghị naanị nke okwu ọnụ ka oziọma anyị rutere unu, kama ọ bụkwa nʼike, na nʼime Mmụọ Nsọ nakwa mmetụta nke dị omimi. Unu maara ụdị ndụ anyị biri nʼetiti unu nʼihi unu.
1TH 1:6 Nke a mere unu ji bụrụ ndị na-eṅomi anyị na Onyenwe anyị. Nʼihi na unu jiri ọṅụ nke Mmụọ Nsọ na-enye nabata oziọma ahụ, nʼagbanyeghị ọtụtụ ahụhụ dị ukwuu nke o wetaara unu.
1TH 1:7 Nʼụzọ dị otu a, unu ghọrọ ihe ilere anya nye ndị niile kwere ekwe nọ na Masidonia na Akaịa.
1TH 1:8 Ugbu a, e sitela na ndụ unu mee ka oziọma Onyenwe anyị gbasaa gabiga Masidonia na Akaịa. Nʼihi na a na-anụ ihe banyere okwukwe unu nwere na Chineke nʼebe niile. Ya mere, ọ dịkwaghị mkpa ka anyị kwuo ihe banyere ya.
1TH 1:9 Nʼihi na ha onwe ha na-ebu ụzọ gwa anyị ihe banyere nnabata unu nabatara anyị, na otu unu si site nʼikpere arụsị tụgharịa, bido ife Chineke dị ndụ, onye bụkwa ezi Chineke,
1TH 1:10 na i chere Ọkpara ya onye ga-esi nʼeluigwe, onye o sitere na ndị nwụrụ anwụ kulite, Jisọs, onye na-anapụta anyị nʼiwe nke na-abịa.
1TH 2:1 Unu onwe unu maara, ụmụnna, na ọbịbịa anyị bịakwutere unu abụghị ihe lara nʼiyi.
1TH 2:2 Anyị tara ahụhụ na mbụ e mekwara anyị ihe ihere na Filipai dịka unu maara, ma site nʼinyeaka Chineke anyị nwere obi ike ịgwa unu oziọma ya, ọ bụladị mgbe a na-eguzogide anyị nʼebe ọ dị ukwuu.
1TH 2:3 Nʼihi na arịrịọ anyị na-arịọ unu esiteghị na njehie pụta maọbụ nʼọchịchọ nke na-adịghị ọcha ma ọ bụkwanụ nʼaghụghọ.
1TH 2:4 Nʼaka nke ọzọ, anyị na-ekwu okwu dị ka ndị ozi Chineke nwapụtara, ndị o tinyere ọrụ oziọma a nʼaka na ntụkwasị obi idebe. Anyị adịghị agbalị ime ihe ga-atọ mmadụ ụtọ, kama anyị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, bụ onye na-enyocha echiche obi anyị.
1TH 2:5 Ọ dịghị mgbe ọbụla, dị ka unu maara, anyị kwuru okwu nrafu maọbụ were ụzọ aghụghọ zoo anya ukwu anyị nwere. Chineke bụ onye akaebe anyị.
1TH 2:6 Ọ dịghị mgbe anyị chọrọ ka ndị mmadụ ọbụla maọbụ unu, maọbụ ndị ọzọ, too anyị.
1TH 2:7 Ọ bụ ezie, dị ka ndị ozi Kraịst, anyị gara abụ ibu arụ nye unu. Kama, anyị biri nʼetiti unu site nʼịdị nwayọọ dị ka ndị bụ nne na-azụ ụmụntakịrị ha, na-elekọta ha.
1TH 2:8 Nʼihi na anyị hụrụ unu nʼanya nke ukwuu ruo na ọ bụghị naanị na anyị kwusaara unu oziọma Chineke kama anyị nyekwara unu ndụ anyị. Nʼihi na unu dị anyị nʼobi nke ukwu.
1TH 2:9 Nʼezie ụmụnna m, amaara m na unu ga-echeta otu anyị si rụọ ọrụ hụjuokwa anya nʼetiti unu. Anyị na-arụ ọrụ ehihie na abalị ịhụ na anyị rụtara ego ga-ezuru anyị, nʼihi na anyị achọghị ịbụ oke ibu nye onye ọbụla mgbe anyị na-ezisara unu oziọma Chineke.
1TH 2:10 Unu onwe unu bụkwa ndị akaebe dị ka Chineke si bụrụ onye akaebe, na mmekọrịta anyị na unu bụ ndị kwere ekwe, bụ nwekọrịta dị ọcha na nke ezi omume, na nke ịta ụta ọbụla na-adịghị na ya.
1TH 2:11 Nʼihi na anyị mesoro onye ọbụla nʼime unu dị ka nna si emeso ụmụ nke ya,
1TH 2:12 na-agba unu ume, na-akasị unu obi, na-akwagidekwa unu na unu kwesiri ibi ndụ kwesiri ụmụ Chineke, onye kpọbatara unu nʼime alaeze ya na ebube ya.
1TH 2:13 Nʼihi nke a, anyị ga-aga nʼihu na-ekele Chineke na-esepụghị aka, nʼihi na mgbe unu nabatara okwu Chineke, bụ nke unu nụrụ nʼọnụ anyị, unu anabataghị ya dị ka okwu mmadụ, kama otu ọ dịkwa nʼeziokwu, ya bụ okwu Chineke, nke na-arụsikwa ọrụ ike nʼime unu bụ ndị kweere ya.
1TH 2:14 Unu onwe unu, ụmụnna m, ghọọnụ ndị na-eṅomi nzukọ nke Chineke nʼime Kraịst Jisọs, ndị nọ na Judịa. Nʼihi na unu onwe unu hụkwara otu ụdị ahụhụ ahụ nʼaka ndị ala unu, dị ka ha onwe ha hụrụ nʼaka ndị Juu.
1TH 2:15 Ndị gburu ndị amụma, gbukwaa Onyenwe anyị Jisọs. Ugbu a ha na-akpagbukwa anyị na-achụpụ anyị. Ha na-emegide Chineke na mmadụ niile
1TH 2:16 site nʼigbochi anyị izisara ndị mba ọzọ oziọma ka a ghara ịzọpụta ha. Ha na-esite nʼụzọ dị otu a na-eme ka iko mmehie ha na-eju. Ma ikpe Chineke adakwasịlarị ha.
1TH 2:17 Otu ọ dị, ụmụnna anyị, mgbe anyị si nʼetiti unu pụọ, nọọ nwa oge nta, ọnọdụ a mere anyị ndị na-enweghị nne na nna (maọbụ na-anụ ahụ ọ bụghị nʼime mmụọ), nʼihi otu unu si gụọ anyị agụụ, anyị gbalịrị ihu unu.
1TH 2:18 Anyị gbalịsịrị ike ịbịakwute unu, karịsịa, mụ onwe m bụ Pọl gbalịrị, gbalịa ịbịa, ma ekwensu gbochiri anyị.
1TH 2:19 Nʼihi na olee ihe bụ olileanya anyị, maọbụ ọṅụ anyị, maọbụ okpueze anyị, nke anyị ga-eji nyaa isi mgbe a ga-eme ka anyị niile guzo nʼihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, mgbe ọ ga-abịa? Ọ bụ na ọ bụghị unu onwe unu?
1TH 2:20 Nʼezie, unu onwe unu bụ ọṅụ na otuto anyị.
1TH 3:1 Ya mere, mgbe anyị na-apụghị ịnagide ya gaa nʼihu, anyị kpebiri ịnọ naanị anyị nʼAtens.
1TH 3:2 Anyị zipụrụ Timoti, onye bụ nwanna anyị, onye anyị na ya so na-arụrụ Chineke ọrụ site nʼịkwusa oziọma Kraịst, ka ọ bịakwute unu, kasịe unu obi, meekwa ka unu guzosie ike nʼokwukwe unu.
1TH 3:3 Ka unu hapụ ịda mba nʼihi mkpagbu ndị a a na-akpagbu unu. Ma ana m eche na unu onwe unu maara na nke a ga-abụ ihe nketa anyị.
1TH 3:4 Nʼihi na mgbe anyị na unu nọ, anyị buru ụzọ gbaara unu ama na ihe ndị a aghaghị ịbịakwasị unu. Ugbu a, ihe niile emezuola dị ka unu matakwara.
1TH 3:5 Nʼihi nke a, mgbe m hụrụ na m apụghị ịnagide ihe ndị ahụ, eziri m ozi, ka a chọpụta maka okwukwe unu. Nʼihi na ụjọ m bụ ma eleghị anya o nweela ụzọ onye ọnwụnwa ọjọọ ahụ si nwaa unu ọnwụnwa nʼoge a, mee ka ndọgbu niile anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ nʼetiti unu bụrụ ihe lara nʼiyi.
1TH 3:6 Ma ugbu a, Timoti esitela nʼebe unu nọ lọghachikwute anyị. O wetara oziọma banyere okwukwe unu na ịhụnanya unu. O mekwara ka anyị mata na unu na-enwe ezi ncheta banyere anyị mgbe niile, na ọ na-agụsị unu agụụ ike ịhụ anyị anya, dị ka o si agụkwa anyị ịhụ unu anya.
1TH 3:7 Nʼihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a gbara ume nke ukwuu, ọ bụladị nʼime mkpagbu niile nke anyị nọ nʼime ya, nʼihi iguzosi ike nke unu guzoro nʼokwukwe unu.
1TH 3:8 Ugbu a anyị ga-adị ndụ, ma ọ bụrụ na unu eguzosie ike nʼime Onyenwe anyị.
1TH 3:9 Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nʼihi akụkọ nyere anyị ọṅụ nʼihu Chineke anyị nʼihi unu.
1TH 3:10 Ehihie na abalị niile, anyị na-arịọ ka anyị hụ unu ihu na ihu, ka anyị nwee ike tinyezuo ihe fọdụrụ nʼokwukwe unu.
1TH 3:11 Ugbu a, ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst megheere anyị ụzọ ịbịakwute unu.
1TH 3:12 Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu baa ụba, ka unu babiga ụba oke nʼịhụnanya unu nwere nye ibe unu, na ndị ọzọkwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị ukwuu nʼebe unu nọ.
1TH 3:13 Ka ọ mee ka obi unu guzosie ike nʼịdị nsọ, na-enweghị ịta ụta ọbụla, nʼihu Chineke na Nna anyị, nʼọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị nsọ ya niile.
1TH 4:1 Nʼikpeazụ, ụmụnna anyị, anyị na-arịọ ma na-akwagidekwa unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, dị ka unu mụtara site nʼaka anyị otu unu kwesiri isi bie ndụ, nakwa ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Unu na-eme nke a karịa.
1TH 4:2 Nʼihi na unu maara ụdị ndụmọdụ ahụ sị nʼaka Onyenwe anyị Jisọs nke anyị nyere unu.
1TH 4:3 Nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke, bụ ị dị nsọ unu. Ka unu wezuga onwe unu site na ịkwa iko,
1TH 4:4 ka onye ọbụla nʼime unu mata ido ahụ nke onwe ya nʼugwu na nʼịdị nsọ.
1TH 4:5 Ọ bụghị nʼụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị mba ọzọ na-amaghị Chineke.
1TH 4:6 Ka onye ọbụla ghara imegbu maọbụ ịghọgbu nwanna ya nʼokwu a. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ata onye na-eme ihe dị otu a ahụhụ, dị ka anyị gwara unu na mbụ, na-adọsikwa unu aka na ntị ike.
1TH 4:7 Nʼihi na ọkpụkpọ Chineke kpọrọ anyị abụghị ka anyị na-ebi ndụ adịghị ọcha kama ọ chọrọ ka anyị dịrị nsọ.
1TH 4:8 Ya mere, onye ọbụla nke jụrụ ịnara ntụziaka a, ọ bụghị mmadụ ka ọ jụrụ, kama ọ bụ Chineke onye na-enye unu Mmụọ Nsọ ya.
1TH 4:9 Ugbu a, ihe gbasara ịhụnanya nke kwesiri ịdị nʼetiti ụmụnna, o kwesighị ka anyị gwa unu ihe ọzọ banyere ya. Nʼihi na unu onwe unu bụ ndị Chineke kuziri ka unu nwee ịhụnanya nʼebe ibe unu nọ.
1TH 4:10 Ma nʼezie, unu na-ahụ ụmụnna anyị niile bi na Masidonia nʼanya. Ma anyị na-arịọsịkwa unu arịrịọ ike sị unu na-ahụkwa ha nʼanya karịa ka unu hụrụ ha ugbu a.
1TH 4:11 Nweenụ agụụ ibi ndụ nwayọọ, na-arụkwanụ ọrụ dịịrị unu. Jirikwanụ aka unu na-arụ ọrụ dịka anyị gwara unu,
1TH 4:12 nke a ga-eme ka ndụ unu na-ebi kwa ụbọchị wetara unu nsọpụrụ nʼebe ndị na-ekweghị ekwe nọ, meekwa ka unu ghara i dabere nʼonye ọbụla.
1TH 4:13 Ụmụnna m, anyị chọrọ ka unu mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara nʼụra ọnwụ, ya ewutela unu dịka o si ewute ndị ọzọ ndị na-enweghị olileanya.
1TH 4:14 Nʼihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie, nʼotu aka ahụ, anyị kwenyekwara na site na Jisọs, Chineke ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ.
1TH 4:15 Nʼihi na okwu nke Onyenwe anyị nke anyị na-akụziri unu bụ nke a, na anyị ndị dị ndụ ruo ọbịbịa Onyenwe anyị agaghị ebu ndị dara nʼụra ọnwụ ụzọ.
1TH 4:16 Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ọ ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie.
1TH 4:17 Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.
1TH 4:18 Ya mere, werenụ okwu ndị a, na-agba onwe unu ume mgbe niile.
1TH 5:1 Ugbu a, ụmụnna, banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-emezu. Echeghị m na ọ dị mkpa i degara unu akwụkwọ.
1TH 5:2 Dị ka unu maara nke ọma na ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi si abịa nʼabalị.
1TH 5:3 Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ.
1TH 5:4 Ma unu onwe unu, ụmụnna, anọghị nʼọchịchịrị, nke ụbọchị ahụ ga-abịakwasị unu na mberede dịka onye ohi.
1TH 5:5 Unu niile bụ ụmụ nke ìhè na ụmụ nke ehihie, anyị abụkwaghị nke ọchịchịrị maọbụ nke abalị.
1TH 5:6 Nʼihi nke a, ka anyị ghara ịdị na-arahụ ụra dị ka ndị ọzọ, kama ka anyị mụrụ anya ka anya dokwaa anyị.
1TH 5:7 Nʼihi na abalị bụ mgbe ndị na-arahụ ụra ji arahụ ụra. Ọ bụkwa nʼabalị ka ndị mmanya na-egbu na-aṅụbiga mmanya oke.
1TH 5:8 Ma ebe anyị niile bụ ndị nke ihe, ka anyị bụrụ ndị anya doro, ndị yi okwukwe na ịhụnanya dịka ihe ikpuchi obi, yikwasịkwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu igwe.
1TH 5:9 Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
1TH 5:10 Ọ nwụrụ nʼihi anyị ka ọ bụrụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-esoro ya dịrị ndụ.
1TH 5:11 Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.
1TH 5:12 Anyị na-arịọsị unu ike, ụmụnna, ka unu na-asọpụrụ ndị niile na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼihi unu, ndị ahụ na-elekọta unu nʼime ọrụ Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adụ unu ọdụ.
1TH 5:13 Ka unu na-akwanyere ha ugwu site nʼịhụnanya nʼihi ụdị ọrụ ha na-arụ. Ka unu na mmadụ ibe unu birikwa nʼudo.
1TH 5:14 Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna, na-adụnụ ndị na-anọ nkịtị ọdụ, na-agbanụ ndị dara mba ume, nyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nwekwanụ ndidi nʼebe ha niile nọ.
1TH 5:15 Ka onye ọbụla ghara inyeghachi mmadụ ibe ya ihe ọjọọ nʼọnọdụ ihe ọjọọ. Kama gbalịsienụ ike ime ezi ihe nʼebe ibe unu nọ na nʼebe mmadụ niile nọ.
1TH 5:16 Na-aṅụrịnụ ọṅụ oge niile.
1TH 5:17 Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka.
1TH 5:18 Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.
1TH 5:19 Unu emenyụla ọkụ Mmụọ Nsọ.
1TH 5:20 Ọzọ unu eledala okwu ndị amụma anya.
1TH 5:21 Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike.
1TH 5:22 Wezuganụ onwe unu nʼihe ọjọọ niile.
1TH 5:23 Ka Chineke ya onwe ya, bụ Chineke nke udo, doo unu nsọ nʼụzọ niile. Ka e debezuo mmụọ unu na mkpụrụobi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọbụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
1TH 5:24 Onye ahụ kpọrọ unu ga-emezu ihe ndị a, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.
1TH 5:25 Biko ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere.
1TH 5:26 Werenụ isurita ọnụ dị nsọ na-ekele ụmụnna anyị dum.
1TH 5:27 Iwu m na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị bụ ka unu gụpụta akwụkwọ a nʼihu ụmụnna niile.
1TH 5:28 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu niile.
2TH 1:1 Pọl, na Saịlas, na Timoti dere akwụkwọ a, Na-edegara nzukọ dị nʼobodo Tesalonaịka nʼime Chineke Nna anyị, na nʼime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
2TH 1:2 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
2TH 1:3 Ụmụnna, anyị aghaghị ikele Chineke ekele mgbe niile banyere unu. O kwesiri ka anyị mee otu a, nʼihi okwukwe unu na-abawanye. Ịhụnanya onye ọbụla nʼime unu nwere nʼebe ibe ya nọ na-abawanyekwa.
2TH 1:4 Nʼihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nʼetiti nzukọ Chineke niile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachiobi nọgidesie ike nʼime nsogbu niile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu, ọ bụladị nʼetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu.
2TH 1:5 Ihe ndị a niile na-egosi na ikpe Chineke bụ nke ziri ezi, nke e ji eme unu ndị kwesiri alaeze Chineke, nke unu na-ata ahụhụ nʼihi ya.
2TH 1:6 Chineke bụ onye ezi omume nʼezie. Ọ ga-eji mkpagbu kwụghachi ndị na-akpagbu unu.
2TH 1:7 Ọ ga-enyekwa unu bụ ndị a na-akpagbu na anyị onwe anyị ezumike. Ọ ga-eme nke a mgbe a ga-eme ka Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị mmụọ ozi si nʼeluigwe pụta ìhè.
2TH 1:8 Ọ ga-abịa nʼụdị ire ọkụ taa ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ na ndị jụrụ ịnabata oziọma nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
2TH 1:9 Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya,
2TH 1:10 nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa ịnara ịja mma na otuto, nʼime ndị nsọ ya, ya na ka ọ bụrụ ihe ịtụnanya nʼebe ndị kweerenụ nọ, nʼihi na unu kwenyere ama nke oziọma ahụ anyị gbaara unu.
2TH 1:11 Nʼihi nke a, anyị na-anọgide nʼekpere nʼihi unu, na-arịọ ka Chineke gụọ unu dịka ndị kwesiri ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na-arịọkwa ka o site nʼike ya mee ka unu mezuo ebumnobi nke ihe dị mma, na ezi ọrụ niile nke okwukwe.
2TH 1:12 Ka e nye aha Onyenwe anyị Jisọs otuto nʼime unu, unu onwe unu nʼime ya kwa, dị ka amara nke Chineke anyị na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst si dị.
2TH 2:1 Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta, anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna.
2TH 2:2 Ka unu ghara ịma jijiji maọbụ ịtụ egwu nʼuche unu nʼihi amụma, maọbụ okwu maọbụ akwụkwọ ozi e dere dị ka o sitere nʼaka anyị, nke na-asị nʼụbọchị Onyenwe anyị eruola.
2TH 2:3 Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu nʼụzọ ọbụla, nʼihi na ụbọchị ahụ agaghị abịa tutu ruo mgbe oke inupu isi ga-adị, na mgbe a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ nke a kara akara ịla nʼiyi.
2TH 2:4 Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu megide ihe niile a na-akpọ chi maọbụ nke a na-efe ofufe, nke ga-eme ka o dozie onwe ya nʼụlọnsọ Chineke, na-ekwupụta na ya bụ Chineke.
2TH 2:5 Unu echetaghị ihe m gwara unu nʼoge mụ na unu nọ banyere ya?
2TH 2:6 Ma ugbu a, unu maara na o nwere onye na-egbochi ya ka ọ hapụ ịpụta ihe. Nʼihi na mgbe ọ ga-apụta bụ mgbe oge ya ruru.
2TH 2:7 Ma ọrụ nzuzo nke mmebi iwu ebidolarị ugbu a, ma onye ahụ na-egbochi ya ịbabiga ụba oke ga-anọgide na-eme otu a tutu ruo mgbe oge e wezugara ya.
2TH 2:8 Mgbe ahụ, a ga-eme ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè, bụ onye Onyenwe anyị Jisọs ga-eji ume ọ ga-esi nʼọnụ ya kupụta laa nʼiyi, ma mee ka ọ ghara ịdịkwa ọzọ site nʼọbịbịa ya.
2TH 2:9 Ọbịbịa onye mmebi iwu ahụ ga-abụ dị ka ọrụ ekwensu si dị, site nʼike ịrụ ọrụ ebube aghụghọ na ihe ịrịbama dị iche iche, na ọrụ ịtụnanya aghụghọ dị iche iche nke ụgha.
2TH 2:10 Ya na ụdị ọrụ ọjọọ dị iche iche nke ọ ga-eji duhie ndị ahụ na-ala nʼiyi. Ha ga-ala nʼiyi nʼihi na ha jụrụ ịhụ eziokwu nʼanya ma nwee nzọpụta.
2TH 2:11 Nʼihi nke a, Chineke ga-ahapụ ha ka e duhie ha, ka ha jiri obi ha niile nabata okwu ụgha ndị a.
2TH 2:12 Ihe nke a pụtara bụ na ndị niile na-ekweghị nʼeziokwu ahụ ma nwee mmasị nʼajọ omume ka a ga-ama ikpe.
2TH 2:13 Anyị kwesiri inye Chineke ekele mgbe niile nʼihi unu ụmụnna ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya. Nʼihi na Chineke esitelarị na mmalite họpụta unu ka unu bụrụ ndị a zọpụtara site nʼọrụ ido nsọ nke Mmụọ Nsọ na site nʼokwukwe unu nʼeziokwu ahụ.
2TH 2:14 Nʼihi nke a, ọ kpọrọ unu site nʼoziọma anyị ka unu nweta otuto nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
2TH 2:15 Ya mere, ụmụnna, nọgidenụ nʼozizi ahụ anyị mere ka unu mụta site nʼozizi anyị ziri unu, maọbụ na akwụkwọ anyị deere unu.
2TH 2:16 Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼonwe ya, na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị nʼanya, site nʼamara ya nye anyị agbamume dị ebighị ebi na ezi olileanya,
2TH 2:17 gbaa obi unu ume, ma mee ka unu guzosie ike nʼịrụ ọrụ na ikwukwa ihe niile dị mma.
2TH 3:1 Nʼikpeazụ, ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere ka ozi Onyenwe anyị gaa nʼihu na-agbasa ruo ebe niile ma bụrụ ihe a na-asọpụrụ, dị ka ọ gbasara nʼetiti unu.
2TH 3:2 Ka e nwee ike napụta anyị nʼaka ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ọ bụghị mmadụ niile nwere okwukwe.
2TH 3:3 Ma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-echebe unu ma gbaakwa unu ume ka unu hapụ ịdaba nʼaka ajọ onye ahụ.
2TH 3:4 Anyị nwere nchekwube nʼime Onyenwe anyị na unu na-eme ma ga-anọgidekwa na-eme ihe niile anyị nyere unu nʼiwu.
2TH 3:5 Ka Onyenwe anyị duzie obi unu ịghọta ịhụnanya Chineke ya na ụdị ntachiobi Kraịst nwere.
2TH 3:6 Ụmụnna, nke a bụ iwu anyị na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka unu zere onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye kwere ekwe nʼime unu na-ebi ndụ umengwụ na onye na-adịghị eso ozizi nke unu natara nʼaka anyị.
2TH 3:7 Nʼihi na unu maara nke ọma nʼime onwe unu na unu kwesiri ịgbaso omume anyị. O nweghị mgbe ọbụla unu hụrụ anyị ka anyị na-agagharị hapụ ọrụ anyị kwesiri ịrụ.
2TH 3:8 O nweghị onye ọbụla anyị riri nri ya nke anyị na-ebughị ụzọ kwụọ ya ụgwọ. Kama anyị rụsịrị ọrụ ike, dọgbukwaa onwe anyị nʼọrụ ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụ ibu arọ nye onye ọbụla.
2TH 3:9 Ọ bụghị na anyị enweghị ikike ịnara unu ihe oriri, kama ọ bụ ka anyị kuziere unu site nʼomume anyị ihe unu ga na-eṅomi.
2TH 3:10 Ọ bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri.”
2TH 3:11 Ma anyị anụla na ụfọdụ nʼetiti unu na-anọ nkịtị na-arụghị ọrụ ọbụla, kama ndị dị otu a na-agagharị, na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha. Ha anaghị arụ ọrụ ọbụla.
2TH 3:12 Anyị na-enye ndị a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, si ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta.
2TH 3:13 Otu ọ dị ụmụnna, unu ekwela ka ike ịrụ ọrụ ọma gwụ unu.
2TH 3:14 Ma ọ bụrụ na ndị ọbụla adịghị erube isi nye ihe anyị kwuru nʼime akwụkwọ ozi a, hụbanụ ndị dị otu a ama ma kwụsịkwa iso ha nwekọ ihe ọbụla, ka ihere mekwa ha.
2TH 3:15 Nʼagbanyeghị nke a, unu agụkwala ha dị ka ndị iro unu, kama nyenụ ha ndụmọdụ dị ka ụmụnna.
2TH 3:16 Ugbu a, ka Onyenwe anyị, onye udo na-esi nʼaka ya abịa tụkwasịrị unu udo ya mgbe niile, nʼime ọnọdụ ọbụla unu nọ nʼime ya. Onyenwe anyị nọnyekwara unu.
2TH 3:17 Mụ onwe m bụ Pọl ji aka m depụta ekele a, nke m na-ekele unu niile. Nke a bụ ihe e ji arịba akwụkwọ niile m dere ama. Otu a ka m si ede ihe.
2TH 3:18 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu niile.
1TI 1:1 Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs site nʼiwu Chineke Onye nzọpụta anyị, na nke Kraịst Jisọs, onye bụ olileanya anyị,
1TI 1:2 Na-edegara gị bụ Timoti ezi nwa m nʼime okwukwe akwụkwọ a. Ka amara, na ebere na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị gị.
1TI 1:3 Dị ka m gbara gị ume, mgbe m na-aga Masidonia, nọgide nʼEfesọs ka i nwee ike nye mmadụ ụfọdụ iwu ka ha ghara ịga nʼihu nʼizi ụkpụrụ dị iche.
1TI 1:4 Mee ka ha kwụsị ịkọ ogologo akụkọ, na inyocha ihe gbasara usoro ọmụmụ dị iche iche nke na-adịghị agwụ agwụ. Nʼihi na ihe ndị a na-eweta ajụjụ na ịrụ ụka na-abaghị uru, kama inyere ndị mmadụ aka ịnabata ụzọ ahụ Chineke kwadoro site nʼokwukwe.
1TI 1:5 Ihe anyị bu nʼobi nye iwu a, bụ ka a kwalite ịhụnanya nke sitere nʼobi ọcha na ezi akọnuche, na okwukwe nke aghụghọ na-adịghị.
1TI 1:6 Ụfọdụ e sikwala nʼihe ndị a dapụ, jehie ụzọ, site nʼoke ịrụ ụka na-abaghị uru.
1TI 1:7 Ha chọrọ ịbụ ndị ozizi iwu ma ha amaghị ihe ha na-ekwu maọbụ ihe ha na-akwadosi ike.
1TI 1:8 Ma anyị maara na iwu dị mma, ma ọ bụrụ na onye ọbụla ewere ya mee ihe a chọrọ ka e jiri ya mee.
1TI 1:9 Ma emeghị iwu nʼihi ndị ezi omume. Kama, e mere iwu nʼihi ndị ahụ na-emebi iwu na ndị na-enupu isi, ndị kpọrọ Chineke asị na ndị mmehie, ndị rụrụ arụ, ndị na-egbu nna ha na nne ha, na ndị na-egbu mmadụ ibe ha,
1TI 1:10 na ndị na-akwa iko na ndị ikom na-emerụ onwe ha nʼahụ ndị ikom ibe ha, ndị na-azụ ahịa ndị ohu, na ndị ụgha niile, na ndị na-agba ama ụgha, tinyere ihe ndị ahụ niile megidere ezi ozizi ahụ,
1TI 1:11 nke dabara nʼoziọma ahụ dị ebube, nke Chineke dị ngọzị, nke o nyefere m nʼaka na ntụkwasị obi ichebe.
1TI 1:12 Ana m ekele Kraịst Jisọs Onyenwe anyị ekele, onye na-enye m ike, nʼihi na ọ gụrụ m dị ka onye e kwesiri ịtụkwasị obi mgbe ọ họpụtara m ijere ya ozi.
1TI 1:13 Ọ bụ ezie na nʼoge gara aga, abụ m onye na-ekwujọ Chineke na onye na-akpagbu ndị ya, bụrụkwa onye na-emegide emegide. Ma Chineke meere m ebere nʼihi na m mere ihe ndị ahụ nʼọnọdụ amaghị ihe, na enweghị okwukwe.
1TI 1:14 Ma Onyenwe anyị wụkwasịrị m amara ya, nke babigara ụba oke, ya na okwukwe na ịhụnanya nʼime Kraịst Jisọs.
1TI 1:15 Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka anabata ya nke ọma: Kraịst Jisọs bịara nʼụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha.
1TI 1:16 Ọ bụ nʼihi nke a ka e ji gosi m ebere, ka Kraịst Jisọs site nʼime m, bụ onye kachasị dị njọ, gosi enweghị ọgwụgwụ nke ntachiobi ya, ka m bụrụ ihe nlere anya nye ndị ahụ niile ga-ekwere na ya, ma nata ndụ ebighị ebi.
1TI 1:17 Ugbu a, ka enye Eze ahụ na-adị ruo mgbe niile, Onye na-adịghị anwụ anwụ, Onye a na-adịghị ahụ anya, Onye naanị ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
1TI 1:18 Ugbu a, Timoti nwa m, ana m enye gị ndụmọdụ a dị ka amụma ahụ e buru banyere gị nʼoge gara aga si dị. Ka ị site nʼịgbaso ya nwe ike ịlụ ezi ọgụ ahụ.
1TI 1:19 Jidesie okwukwe i nwere ike, ya na ezi akọnuche. Nʼihi na ụfọdụ ajụla ezi akọnuche ma si otu a dapụ nʼokwukwe.
1TI 1:20 Haimeniọs na Alegzanda so na ndị a. Ewerela m ha nyefee Ekwensu nʼaka, ka ọ taa ha ahụhụ tutu ruo mgbe ha mụtara na ha ekwesighị ikwu okwu nkwulu megide Chineke.
1TI 2:1 Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ekele nʼisi mmadụ niile,
1TI 2:2 kpee ekpere maka ndị eze niile, na ndị niile nọ nʼọnọdụ ọchịchị, ka anyị nwee ike bie ndụ udo na nke nsogbu na-adịghị, nʼime ịsọpụrụ Chineke dị ka ọ chọrọ.
1TI 2:3 Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke Onye nzọpụta anyị ezi ụtọ.
1TI 2:4 Onye chọrọ ka a zọpụta mmadụ niile, ka ha niile bịaruo na mmazu nke eziokwu.
1TI 2:5 Nʼihi na ọ bụ naanị otu Chineke dị. Ọ bụkwa naanị otu onye ogbugbo dị nʼetiti Chineke na mmadụ. Kraịst Jisọs, onye ya onwe ya bụ mmadụ.
1TI 2:6 Onye weere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nʼihi mmadụ niile, nke bụ ịgba ama a na-enye nʼoge ya.
1TI 2:7 Nʼihi nke a, a họpụtara m ka m bụrụ ọnụ na-ekwuru ọha nakwa onyeozi, na onye nkuzi nye ndị mba ọzọ banyere ezi okwukwe ahụ. Eziokwu ka m na-ekwu, anaghị m agha ụgha.
1TI 2:8 Nʼihi nke a, achọrọ m ka ndị ikom, nʼebe niile na-achili aka dị nsọ elu nʼekpere, na-ebughị iwe nʼobi, na-arụkwaghị ụka.
1TI 2:9 Achọkwara m ka ndị inyom kwadoo onwe ha nʼụzọ kwesiri ekwesi, ka ha jiri nsọpụrụ na uche zuruoke chọọ onwe ha mma. Ọ bụghị isi a kpara akpa, ma ọ bụkwanụ ngwa mma nke ọlaedo maọbụ pieal, maọbụ uwe dị oke ọnụahịa ha na-eyi.
1TI 2:10 Kama site nʼezi ọrụ ọma ha nke kwesiri ndị inyom na-ekwupụta na ha na-ekpere Chineke.
1TI 2:11 Nwanyị kwesikwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe.
1TI 2:12 Ekwenyeghị m ka nwanyị zie ihe, maọbụ ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ndị nwoke nọ. Ha kwesiri ịnọ nwayọọ mgbe ọbụla unu zukọrọ.
1TI 2:13 Ọ bụ nʼihi na e buru ụzọ kee Adam tupu e kee Iiv.
1TI 2:14 Ọ bụkwaghị Adam ka a ghọgburu, kama ọ bụ nwanyị ka a ghọgburu mee ka ọ bụrụ onye mmebi iwu.
1TI 2:15 Ma a ga-azọpụta ha site nʼọmụmụ nwa ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuruoke.
1TI 3:1 Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi ma bụrụkwa eziokwu, bụ nke na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla na-achọ ọnọdụ ịbụ ụkọchukwu, ọ na-achọ ezi ọrụ kacha mma.
1TI 3:2 Ya mere onye ụkọchukwu kwesiri ịbụ onye a na-adịghị ata ụta, onye lụrụ otu nwunye, onye obi umeala, onye na-achịkọta onwe ya nke ọma, onye nwere nsọpụrụ, onye na-anabata ndị ọbịa nʼụlọ ya, nakwa onye nwere ike ikuzi ihe.
1TI 3:3 Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, ọ gaghị abụ onye na-alụkarị ọgụ, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ, onye na-ahụghị okwu na ụka nʼanya, na onye na-adịghị ahụ ego nʼanya.
1TI 3:4 Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinaụlọ ya nke ọma, bụrụkwa onye na-achịkwa ụmụ ya inwe nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla.
1TI 3:5 (Nʼihi na ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike chịkọtazie ezinaụlọ ya, ọ ga-esi aṅaa chịzie chọọchị Chineke?)
1TI 3:6 Ọ gaghị abụ onye chegharịrị ọhụrụ, ma ọ bụghị ya, ọ ga-afụlị onwe ya elu nʼịnya isi, ma si otu a daba nʼọmụma ikpe dị ka ekwensu.
1TI 3:7 Ọ ga-abụkwa onye nwere ezi ama nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, ka ọ ghara ịdaba nʼọnọdụ ihere nakwa nʼọnya ekwensu.
1TI 3:8 Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị na-enweghị ire abụọ, ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị akpịrị ego na-agbaso uru nʼezighị ezi.
1TI 3:9 Ha ga-abụ ndị ji akọnuche dị ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike.
1TI 3:10 Tupu a họpụta ha ịrụ ọrụ a, a ga-ebu ụzọ nwalee ha. Ọ bụrụ na ha enweghị ebubo ọbụla megide ha, mgbe ahụ, a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị.
1TI 3:11 Otu aka ahụ kwa, ndị nwanyị kwesikwara ịbụ ndị nwere nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla, ndị na-adịghị ebu iro nʼobi, ndị na-adịghị agba asịrị, kama ndị nwere obi umeala, na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼihe niile.
1TI 3:12 Ndị niile a ga-ahọpụta ije ozi na chọọchị aghaghị ịbụ ndị nwere naanị otu nwunye, ndị na-achịzi ụmụ ha na ezinaụlọ nke aka ha nke ọma.
1TI 3:13 Nʼihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkwuwa okwu ha nwere banyere okwukwe a nʼime Kraịst Jisọs.
1TI 3:14 Enwere m olileanya na m ga-abịa ileta gị na mgbe na-adịghị anya, ma ana m edere gị ihe ndị a.
1TI 3:15 Asị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ, ị ga-amata otu ndị mmadụ kwesiri isi bie obi nʼezinaụlọ Chineke, nke bụ nzukọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ntọala nke eziokwu ahụ.
1TI 3:16 Karịchasịa nke a, ọ bụ ihe omimi dị ukwuu, bụ ntọala ebe ezi ịdị nsọ si walite: Ọ pụtara ihe nʼụdịdị mmadụ, Mmụọ Nsọ gosiri na ọ bụ onye ezi omume, ndị mmụọ ozi hụrụ ya, e kwusara ihe banyere ya nye mba niile, ụwa niile kwenyeere na ya, a nabatakwara ya nʼebube nke eluigwe.
1TI 4:1 Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nʼoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nʼime chọọchị ga-esite nʼokwukwe wezuga onwe ha, bụrụ ndị na-agbaso mmụọ nduhie nakwa ozizi ihe banyere mmụọ ọjọọ.
1TI 4:2 Ozizi dị otu a na-esite nʼihu abụọ nke ndị ụgha, bụ ndị eji igwe ọkụ da nwụọ akọnuche ha.
1TI 4:3 Ndị dị otu a na-egbochi ịlụ dị na nwunye na iri ihe oriri ụfọdụ. Ma ọ bụ Chineke kere ihe oriri ndị a ka ndị kwere ekwe, ndị maara eziokwu ahụ jiri ekpere na ekele nara ha.
1TI 4:4 Ihe niile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma ọ bụrụ na e jiri ekele nara ya,
1TI 4:5 nʼihi na-esitere nʼokwu Chineke na ekpere doo ya nsọ.
1TI 4:6 Ọ bụrụ na ị mee ka ụmụnna mara ihe ndị a, ị ga-abụ ezi onyeozi Kraịst Jisọs, onye a zụlitere nke ọma site nʼeziokwu nke okwukwe, na ezi ozizi nke ị gbasoro.
1TI 4:7 Atụfula oge gị nʼịrụ ụka rụrụ arụ banyere akụkọ ifo nzuzu, na akụkọ na-abaghị uru nke ndị agadi nwanyị na-akọ. Kama zụọ onwe gị ka ị bụrụ onye nke na-asọpụrụ Chineke.
1TI 4:8 Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma kama ịbụ onye nke Chineke bara uru karịa nʼụzọ ọbụla, nʼihi na nkwa dị nʼime ya bụ banyere ndụ dị ugbu a na ndụ dị nʼihu.
1TI 4:9 Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka a nara ya nke ọma.
1TI 4:10 Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ na-ahụjukwa anya maka na anyị tụkwasịrị olileanya anyị na Chineke dị ndụ, onye bụ Onye nzọpụta mmadụ niile, karịchasịa, nke ndị niile kwere ekwe.
1TI 4:11 Ndị a bụ ihe ndị ị ga-akụzi, kwudosie ike na-akụzi ha.
1TI 4:12 Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche.
1TI 4:13 Tutu ruo mgbe m ga-abịa nʼebe ahụ, na-agụpụta ma na-akọwakwara ndị chọọchị ihe e dere nʼime akwụkwọ nsọ. Na-ekwusakwa okwu Chineke.
1TI 4:14 Elelịla onyinye ime mmụọ nke i nwere anya, bụ nke e nyere gị site nʼibu amụma pụtara ihe mgbe ndị okenye bikwasịrị gị aka nʼisi.
1TI 4:15 Jiri onyinye ndị a niile rụọ ọrụ, nọgidesie ike nʼọrụ gị, ka onye ọbụla mata, hụkwa na ị na-eme nke ọma.
1TI 4:16 Na-elezi anya na ndụ gị, na ozizi gị. Nọgidesie ike nʼihe ndị a nʼihi na site na ha, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.
1TI 5:1 Abarala okenye mba nʼolu dị ike, kama jiri arịrịọ na nsọpụrụ gwa ya okwu dị ka ọ bụ nna gị. Na-agwa ụmụ okorobịa okwu dị ka ị ga-esi gwa ụmụnne gị ị hụrụ nʼanya okwu.
1TI 5:2 Na-emeso ndị inyom ndị bụ okenye omume dị ka ndị nne, ma na-emesokwa ụmụ agbọghọ omume dị ka ị ga-esi mesoo ụmụnne gị nwanyị omume. Na-echekwa uche nʼịdị ọcha nʼebe o zuruoke.
1TI 5:3 Sọpụrụnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ndị na-ebi ndụ dị ka ndị di ha nwụrụ anwụ nʼeziokwu.
1TI 5:4 Kama ọ bụrụ na nwanyị ọbụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, maọbụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesiri ibu mkpa ha. Nʼihi na anyị kwesiri isite nʼụlọ anyị gosi obiọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nʼihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.
1TI 5:5 Nwanyị di ya nwụrụ nʼezie, nke na-enweghị onye na-elekọta ya anya, atụkwasịla obi ya na olileanya na Chineke. Ọ na-anọgidekwa nʼekpere na arịrịọ ehihie na abalị.
1TI 5:6 Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nʼaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụrịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ.
1TI 5:7 Nye ha ihe ndị a dịka iwu, ka ha ghara ị bụ ndị a na-ata ụta.
1TI 5:8 Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ.
1TI 5:9 Nwanyị ọbụla di ya nwụrụ ga-aba nʼotu ndị di ha nwụrụ ga-abụ onye gbara iri afọ isii maọbụ karịa. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ naanị otu di.
1TI 5:10 Ọ ga-abụ onye mmadụ niile na-agbara ezi ama, nʼihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nʼụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, onye na-asa ụkwụ ndị nsọ na onye jikeere mgbe niile ime ihe ọma.
1TI 5:11 Ma o kwesighị ka e debanye aha ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nʼotu ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ. Nʼihi na mgbe ọchịchọ anụ ahụ jidesiri ha ike, ha ga-enupuru Kraịst isi, chọwa ịlụ di ọzọ.
1TI 5:12 Ụdị omume a ga-ewetara ha ikpe ọmụma, nʼihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ.
1TI 5:13 Wezugakwarị nke a, na ha amụta omume ịdị umengwụ, nʼaga nʼụlọ dị iche iche. Ọ bụghị naanị na ha bụ ndị na-adịghị arụ ọrụ, kama ha na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha, na-akpa asịrị, na-ekwu okwu nzuzu, na-ekwu ihe ha ekwesighị ikwu.
1TI 5:14 Nʼihi nke a, ana m adụ ndị ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ ọdụ ka ha lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinaụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye iro ọbụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide anyị.
1TI 5:15 Ụfọdụ ndị mmadụ adahielarị ụzọ, soro ekwensu.
1TI 5:16 Ya mere, nwanyị ọbụla kwere ekwe, nke nwere nʼezinaụlọ ya ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, ya jisie ike gboro ha mkpa. Ọ dịghị mma ibogbu chọọchị nʼibu, ka o nwee ike iletazu ndị nọ nʼọnọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ nʼezie.
1TI 5:17 Nye ndị okenye, ndị na-achị nke ọma nsọpụrụ kwesiri ekwesi na ụgwọ ọrụ okpukpu abụọ, ọkachasị ndị na-adọgbu onwe ha nʼọrụ izi oziọma na nʼikuzi ihe.
1TI 5:18 Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka,” hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ, ọzọkwa, “Onye na-arụ ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya.”
1TI 5:19 Egela ntị nʼebubo ọjọọ ọbụla a na-ebo onye okenye karịakwa maọbụ na ndị akaebe abụọ maọbụ atọ gbara ama megide ya.
1TI 5:20 Ma ndị okenye ahụ nọgidere na-eme mmehie, kpọpụta ha baara ha mba nʼihu mmadụ niile, ka ndị ọzọ tụọ egwu gharakwa iso omume ha.
1TI 5:21 Ana m adọ unu aka na ntị nʼihu Chineke na nʼihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼihu ndị mmụọ ozi a họpụtara, ka unu debe ụkpụrụ ndị a niile, nye onye ọbụla ntaramahụhụ nke ruru ya, elekwala onye ọbụla anya nʼihu.
1TI 5:22 Ebikwasịkwala onye ọbụla aka nʼisi ọsịịsọ ime ya okenye maọbụ onye na-eje ozi. Ekwela ka i keta oke na mmehie ndị ọzọ. Debe onwe gị ọcha.
1TI 5:23 Aṅụkwala naanị mmiri ọzọ, na-aṅụ ntakịrị mmanya maka afọ gị na nrịa nrịa nke na-arịa gị ọtụtụ mgbe.
1TI 5:24 Mmehie ụfọdụ mmadụ na-apụta ihe ma na-ebukwa ha ụzọ rụọ oche ikpe, ma ndị ọzọ ka a na-ahụta mmehie ha nʼoge ikpeazụ.
1TI 5:25 Otu a kwa, ọrụ ọma na-apụta ihe, ma ọ bụladị ndị na-apụtaghị ihe, apụghị izo ha ezo.
1TI 6:1 Ndị niile bụ ohu ga-ahụ ndị nwe ha dị ka ndị ekwesiri inye ugwu na nsọpụrụ, ka a ghara ikwujọ aha Chineke na ozizi anyị.
1TI 6:2 Ndị nke nwere ndị kwere ekwe dịka ndị nwe ha ekwesighị ilelị ha anya nʼihi na ha bụ ụmụnna ha. Kama, ha kwesiri ijere ndị nwe ha ozi nke ọma karịa, nʼihi na ndị na-erite uru nʼọrụ ha bụ ndị kwere ekwe bụrụkwa ndị anyị hụrụ nʼanya. Ihe ndị a ka ị ga-akụziri ha, dụkwaa ha ọdụ banyere ime nke a.
1TI 6:3 Onye ọbụla na-ezi ihe ọzọ nke na-adabaghị nʼokwu ezi ntọala na-enye ndụ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na ozizi nke ibi ndụ kwesiri onye nke Chineke,
1TI 6:4 bụ onye nganga na-afụli elu, ma bụrụkwa onye na-amaghị ihe. Ọchịchọ obi ya bụ nke na-ezighị ezi ma jupụtakwa nʼịrụ ụka na ekworo nke na-eweta ịkpọ asị na esemokwu, na nkwulu nakwa ajọ echiche,
1TI 6:5 na isi ịrụ ụka niile nke na-esite nʼaka ụmụ mmadụ ndị echiche ha na-enweghịkwa eziokwu. Ha na-eche na ife Chineke bụ ụzọ e si aba ọgaranya.
1TI 6:6 Ma ikpere Chineke bara uru nke ukwuu nye onye nwere afọ ojuju nʼihe ọbụla o nwere.
1TI 6:7 Nʼihi na o nweghị ihe anyị ji nʼaka mgbe anyị bịara nʼụwa, otu a kwa, o nweghị ihe anyị ga-ewerekwa mgbe anyị ga-esi nʼụwa pụọ.
1TI 6:8 Ya mere, ọ bụrụ na anyị enwe ihe oriri na uwe anyị ji ekpuchi ọtọ anyị, afọ kwesiri iju anyị nʼihe anyị nwere.
1TI 6:9 Ma ndị na-achọ ịba ọgaranya na-adaba nʼọnwụnwa na nʼime ọnya na ọtụtụ ihe nzuzu na ọchịchọ ọjọọ niile dị iche iche nke na-enubanye ha nʼịla nʼiyi na mbibi.
1TI 6:10 Nʼihi na ịhụ ego nʼanya bụ mgbọrọgwụ nke ime ihe ọjọọ niile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nʼanya, ndị na-achọsi ya ike, adapụla nʼokwukwe ha, si otu a tinye onwe ha nʼọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru ụjụ.
1TI 6:11 Ma gị bụ onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a niile ọsọ. Ma chụsoo ezi omume na iyi Chineke, na okwukwe, na ịhụnanya, na ntachiobi, na ịdị nwayọ.
1TI 6:12 Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe gị ike, jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ aka ike bụ nke a kpọrọ gị oku maka ya mgbe i mere ezi nkwupụta gị nʼihu ọtụtụ ndị akaebe.
1TI 6:13 Nʼihu Chineke, onye na-enye ihe niile ndụ, na nʼihu Kraịst Jisọs onye gbara ama nkwupụta ọma nʼihu Pọntiọs Pailet. Ana m enye gị iwu
1TI 6:14 ka i debezuo ihe niile e nyere nʼiwu na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ịta ụta ruo mgbe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-apụta ihe.
1TI 6:15 Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site nʼike ya, Chineke, onye dị ngọzị na onye naanị ya na-achị, Eze kachasị eze niile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.
1TI 6:16 Onye naanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebikwa nʼime ìhè nke mmadụ ọbụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọbụla na-ahụbeghị anya mgbe ọbụla, onye a na-apụghịkwa ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amen.
1TI 6:17 Nye ndị bụ ọgaranya nʼoge ugbu a iwu ka ha ghara ịnya isi, maọbụ tụkwasị obi ha nʼakụnụba, nke a na-ejighị aka. Kama ka ntụkwasị obi ha dịrị na Chineke onye na-enyezu anyị ihe niile site nʼakụ ya nʼihi ime anyị obi ụtọ.
1TI 6:18 Gwa ha ka ha na-eme ezi ihe, ka ha bụrụ ọgaranya nʼọrụ ọma niile, ka ha nwee obiọma na inyere ndị ọzọ aka, dịkwa njikere ikenye ndị ọzọ ihe site nʼihe ha nwere.
1TI 6:19 Nʼụzọ dị otu a, ha na-akpadoro onwe ha akụ nke ga-abụrụ ha ntọala siri ike nʼọgbọ dị nʼihu, nke a ga-eme ka ha rite ndụ ahụ nke bụ ezigbo ndụ nʼuru.
1TI 6:20 Timoti chebekwa ihe ndị ahụ e nyefere gị nʼaka, wezuga onwe gị site nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, na ịrụ ụka nzuzu nke ha na-akpọ ihe ọmụma,
1TI 6:21 bụ nke ụfọdụ kwupụtara, ma na ime nke a, ha esitela nʼụzọ okwukwe kpafuo. Ka amara dịnyere gị. Amen.
2TI 1:1 Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs, dị ka uche Chineke si dị, na dị ka nkwa ndụ nʼime Kraịst Jisọs si dị,
2TI 1:2 Nye gị Timoti, ezi nwa m. Ka amara, na ebere na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị gị.
2TI 1:3 Ana m ekele Chineke, bụ onye m na-ejere ozi ekele, dị ka nna nna m ha mere site nʼakọnuche dị ọcha, ọtụtụ mgbe ka m na-echeta gị nʼekpere m ehihie na abalị.
2TI 1:4 Ka m na-echeta anya mmiri gị, ọ na-agụsị m agụụ ike ehihie na abalị ịhụ gị, ka ọṅụ m zuo oke.
2TI 1:5 Emere m ka m cheta okwukwe ihu abụọ nʼadịghị nke i nwere, bụ okwukwe nke burii ụzọ dịrị nʼime nne nne gị Lọịsi, bịa dịkwa nʼime nne gị Yunaịsi. Emere ka m kwenye na otu okwukwe ahụ dịkwa nʼime gị.
2TI 1:6 Nʼihi nke a, achọrọ m ichetara gị ka i mee ka onyinye Chineke ahụ i nwere na-enwu dị ka ọkụ, bụ nke i natara mgbe m bikwasịrị gị aka m abụọ nʼisi.
2TI 1:7 Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.
2TI 1:8 Ihere emela gị ikwupụta ama banyere Onyenwe anyị maọbụ banyere m bụ onye mkpọrọ ya. Kama, site nʼike Chineke, soro m hụọ ahụhụ nʼihi oziọma ahụ.
2TI 1:9 Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a.
2TI 1:10 Ugbu a, o meela ka ihe niile o zubere pụta ìhè site nʼọbịbịa Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike ọnwụ nʼiyi, zi anyị ụzọ anyị ga-esi nwee ndụ ebighị ebi site nʼoziọma ahụ.
2TI 1:11 Nʼihi oziọma a, ahọpụtara m ka m bụrụ onye na-ekwusa oziọma a, na onyeozi, na onye nkuzi.
2TI 1:12 Ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji na-ahụ ahụhụ ndị a nʼebe a, ma nʼeziokwu, ihere adịghị eme m, nʼihi na amaara m onye m na-atụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe niile m nyere ya nʼaka idebe tutu ruo ụbọchị ahụ.
2TI 1:13 Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nʼime Kraịst Jisọs.
2TI 1:14 Chezie onyinye ọma ahụ e sitere nʼaka Mmụọ Nsọ bi nʼime gị nye gị idebe.
2TI 1:15 Dị ka i maara, ndị niile si nʼEshịa bịa nʼebe a agbakụtala m azụ. Ọ bụladị Faigelọs na Hamogịnịs ahapụla m laa.
2TI 1:16 Ka Onyenwe anyị mere ezinaụlọ Onisiferọs ebere, nʼihi ume ọ gbara m ọtụtụ mgbe. Ihere emeghị ya na-abụ m onye mkpọrọ.
2TI 1:17 Mgbe ọ bịaruru Rom, ọ chọgharịrị m nʼebe niile, ma nʼikpeazụ, ọ chọtara m.
2TI 1:18 Ka Onyenwe anyị kwe ka ọ nata ebere nʼaka Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. Ị mara nke ọma ụdị aka o nyere m nʼEfesọs.
2TI 2:1 Ya mere, nwa m, bụrụ onye dị ike site nʼamara ahụ Kraịst Jisọs na-enye.
2TI 2:2 Ihe niile nke ị nụrụ nʼọnụ m nʼihu ọtụtụ ndị ama ka ị ga-enyefe nʼaka ndị kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị nwekwara ike izi ndị ọzọ ihe ndị a.
2TI 2:3 Soro m kere oke nʼahụhụ dị ka ezi onye agha Jisọs Kraịst.
2TI 2:4 Ọ dịghị onye agha ọbụla na-ekekọta onwe ya nʼihe nke ụwa a, kama ọ na-achọ ime ihe ga-atọ onye họpụtara ya dị ka onye agha ụtọ.
2TI 2:5 Otu aka ahụ, onye na-agba ọsọ agaghị enweta okpu mmeri, ma ọ bụrụ na ọ gbaghị ọsọ ya dịka usoro iwu ịgba ọsọ si dị.
2TI 2:6 Onye ọrụ ubi na-adọgbu onwe ya nʼọrụ kwesiri ịbụ onye ga-ebu ụzọ rie mkpụrụ sitere nʼubi ya.
2TI 2:7 Na-atụgharị uche nʼihe m kwuru, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enye gị nghọta nʼime ha niile.
2TI 2:8 Echefula Jisọs Kraịst, onye a kpọlitere site nʼọnwụ, onye sikwa nʼagbụrụ Devid, nke a bụ oziọma m.
2TI 2:9 Ọ bụ nʼihi na m na-ekwu eziokwu ndị a ka m ji nọọ na-ahụ ahụhụ dị otu a dị ka onye ọjọọ, ma otu ọ dị, ekeghị okwu Chineke agbụ.
2TI 2:10 Ya mere, ana m anagide ihe niile nʼihi ndị a họpụtara, ka ha bụrụkwa ndị ga-anata nzọpụta dị nʼime Kraịst Jisọs, na ebube ebighị ebi.
2TI 2:11 Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi: Ọ bụrụ na anyị esoro ya nwụọ, anyị ga-esokwa ya dị ndụ.
2TI 2:12 Ọ bụrụ na anyị anagide, anyị ga-esokwa ya chịa ọchịchị. Ọ bụrụ na anyị ajụ ya, ọ ga-ajụkwa anyị.
2TI 2:13 Ọ bụrụ na anyị ekweghị ekwe, ọ ga-anọgide nʼikwesị ntụkwasị obi, nʼihi na o nweghị ike ịjụ onwe ya.
2TI 2:14 Na-echetara ha nke a, na-agwasikwa ha ike nʼaha Chineke ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nʼihi na okwu ndị a abaghị uru, ha na-ewetara ndị na-anụ ya ịla nʼiyi.
2TI 2:15 Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma.
2TI 2:16 Zere onwe gị nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, nʼihi na ọ na-aga nʼihu iduba ndị mmadụ nʼọnọdụ amaghị Chineke karịa.
2TI 2:17 Ozizi ha ga-agbasa dị ka nsị, Haimeniọs na Filetus soo na ndị dị otu a.
2TI 2:18 Ha ahapụla ịgbaso ụzọ eziokwu ahụ bido na-ekwusa okwu ụgha, na-asị na oge mbilite nʼọnwụ agafeela. Site nʼokwu ha, ha na-ekpu okwukwe mmadụ ụfọdụ ihu nʼala.
2TI 2:19 Ma ntọala Chineke hiwere na-eguzosi ike. Nʼelu ya ka eji ihe e dere kaa akara: “Onyenwe anyị maara ndị bụ ndị nke ya,” ya na, “Ka onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye nke Kraịst kwụsị ibi ndụ ajọ omume.”
2TI 2:20 Nʼime ụlọ ukwuu, ọtụtụ ngwa ọrụ dị ya, ndị e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, maọbụ osisi maọbụ ụrọ kpụọ. Ụfọdụ ka e ji eje ozi nʼoge nkwanye ugwu dị mkpa, ndị ọzọ ka e ji eje ozi nʼoge ọbụla.
2TI 2:21 Ọ bụrụ na onye ọbụla edoo onwe ya ọcha pụọ nʼihe ọjọọ niile, ọ ga-abụ ngwa ọrụ e mere maka ọrụ ndị kwesiri nkwanye ugwu, bụrụkwa onye dị nsọ, onye na-abara Onyenwe ya uru, na onye dị njikere mgbe ọbụla ịrụ ezi ọrụ.
2TI 2:22 Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta.
2TI 2:23 Wezuga onwe gị nʼịrụ ụka nzuzu na nke amaghị ihe niile, nʼihi na ị maara na ha na-eweta ise okwu.
2TI 2:24 O kwesikwaghị ka ohu Onyenwe anyị bụrụ onye na-ese okwu, kama, ọ ga-abụ onye obiọma nye mmadụ niile, na onye ma otu e si ezi ihe, onye dị njikere ịnagide ihe ọjọọ e mere ya.
2TI 2:25 Ọ ga-ejiri obi dị nwayọ mgbe ọ na-adụ ndị iro ya ọdụ. Eleghị anya Chineke nwere ike mee ka ha chegharịa, bịa mata eziokwu.
2TI 2:26 Mgbe ahụ, ha nwere ike gbanahụ ọnya ekwensu, ka o jidechara ha ka ha mee uche ya.
2TI 3:1 Ma mara nke a, na nʼoge dị oke egwu ga-adị mgbe ikpeazụ.
2TI 3:2 Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha.
2TI 3:3 Ndị na-enweghị ịhụnanya nʼobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị na-agba asịrị, ndị na-emebiga ihe ọjọọ oke, ndị na-eme dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ.
2TI 3:4 Ndị na-arara ibe ha nye nʼaka ndị iro ha, ndị isiike, ndị onwe ha juru afọ; ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nʼanya, kama ịhụ Chineke nʼanya.
2TI 3:5 Ha bụ ndị na-ebi ndụ ndị nke Chineke ma ha adịghị egosipụta ike dị na ndụ ahụ. Zere onwe gị nʼebe ndị dị otu a nọ.
2TI 3:6 Ụfọdụ nʼime ha bụ ndị na-abanye nʼime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nʼihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụobi ha agụụ.
2TI 3:7 Ndị a na-akụziri ihe oge niile, ma ha apụghị inweta amamihe nke eziokwu.
2TI 3:8 Dị ka Jenas na Jembaras si lụso Mosis ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ha bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nʼebe okwukwe anyị dị.
2TI 3:9 Ma ha agaghị aga nʼihu nʼihi na nzuzu ha ga-apụta ihe nʼihu mmadụ niile, dịka nke mmadụ abụọ ahụ.
2TI 3:10 Ma ugbu a, ị maara ihe niile banyere ozizi m, na omume m, na ebumnuche m, na okwukwe m na ntachiobi m, na ịhụnanya m, na ndidi m,
2TI 3:11 na mkpagbu m na ahụhụ niile nke dakwasịrị m nʼAntiọk, na Aikoniọm, na Listra. Ị maara ụdị mkpagbu dị iche iche m gabigara. Ma Onyenwe anyị napụtara m site nʼime ha niile.
2TI 3:12 Nʼezie, ndị niile chọrọ ibi ndụ ịsọpụrụ Chineke nʼime Kraịst Jisọs ga-agabiga mkpagbu.
2TI 3:13 Ma ndị mmadụ ọjọọ na ndị na-ebi ndụ aghụghọ ga-ajọ njọ karịa ka ha dị. Ha ga-eduhie ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a ga-eduhie.
2TI 3:14 Ma gị onwe gị, nọgidesie ike nʼihe ịmụtara na ihe i kwenyesịrị ike na ya, ebe ị maara onye i si nʼaka ya mụta ha.
2TI 3:15 Ị maara na ọ bụ site nʼoge ị bụ nwantakịrị ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri doo gị anya, nke nwere ike ikuziri gị maka nzọpụta site nʼokwukwe i nwere nʼime Kraịst Jisọs.
2TI 3:16 Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume:
2TI 3:17 ka onye nke Chineke zuo oke, dịkwa njikere maka ịrụ ezi ọrụ niile ọbụla.
2TI 4:1 Ya mere, ana m adụsi gị ọdụ ike nʼihu Chineke na nʼihu Kraịst Jisọs, onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. Ejikwa m ọbịbịa ya na alaeze ya na-asị gị,
2TI 4:2 kwusaa okwu ahụ mgbe niile; dịkwa njikere, mgbe o kwesiri ekwesi na mgbe ọ na-ekwesighị, jiri ya nye ntụziaka, jiri ya baa mba, jirikwa ya gbaa ndị mmadụ ume, site na ntachiobi na ilezi anya inye ezi ndụmọdụ.
2TI 4:3 Nʼihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị ịchọ ndị ozizi ha ga-eji gbaa onwe ha gburugburu, ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ.
2TI 4:4 Ha agaghị ege ntị nʼeziokwu ahụ, kama ha ga-ege ntị nʼakụkọ na-enweghị isi.
2TI 4:5 Ma guzosie ike, nọọ na nche mgbe niile, na-edi ahụhụ, na-arụkwa ọrụ gị dịka onye oziọma. Rụzukwaa ihe ị kwesiri ịrụ nʼọrụ gị.
2TI 4:6 Nʼihi na ugbu a, abụrụla m rịị onye a na-awụpụ dị ka aja ihe ọṅụṅụ, oge ụla m eruokwala.
2TI 4:7 Alụsịala m ọgụ ọma ahụ, agbasịala m ọsọ ahụ, edebezuokwala m okwukwe ahụ.
2TI 4:8 Ugbu a, e deberela m okpueze nke ezi omume, nke Onyenwe anyị, onye ikpe ezi omume ahụ, ga-enye m nʼụbọchị ahụ. Ma ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye ya, kama ọ ga-enyekwa ya ndị ahụ niile ọ na-agụsị agụ ike ịhụ ya anya.
2TI 4:9 Gbalịsie ike ịbịakwute m ọsịịsọ,
2TI 4:10 nʼihi na Dimas onye hụrụ ihe ndụ a nʼanya ahapụla m gaa Tesalonaịka. Kresens agaala Galeshịa, Taịtọs agakwaala Dalmetia.
2TI 4:11 Ọ bụ naanị Luk nọnyere m. Mgbe ị na-abịa, kpọta Mak nʼihi na ọ ga-enyere m aka nʼije ozi m.
2TI 4:12 Ezipụla m Taịkikọs ka ọ gaa Efesọs.
2TI 4:13 Mgbe ị na-abịa, wetara m uwe m ji achụ oyi, bụ nke m hapụrụ nʼaka Kapọs na Troas, wetakwara m akwụkwọ m niile ahụ dị nʼebe ahụ, ọkachasị akwụkwọ akpụkpọ anụ niile ahụ.
2TI 4:14 Alegzanda onye na-akpụ ọla emeela m ọtụtụ ihe ọjọọ. Onyenwe anyị ga-akwụghachi ya dị ka ihe o mere m si dị.
2TI 4:15 Kpachara anya nʼebe ọ nọ, nʼihi na o guzosiri ike megide ihe niile anyị kwuru.
2TI 4:16 Na mbụ, mgbe m pụtara ikpere ọnụ m, ọ dịghị onye kwụnyeere m. Ha niile gbahapụrụ m. Ka a hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie.
2TI 4:17 Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ike ikwusa oziọma ka ndị mba ọzọ niile nụrụ ya. Ọ zọpụtara m, site nʼọnụ ọdụm.
2TI 4:18 Onyenwe anyị ga-azọpụtakwa m site nʼihe ọjọọ niile ọbụla, kpọbata m nʼudo baa nʼalaeze eluigwe ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
2TI 4:19 Keleere m Prisila na Akwila na ndị niile bi nʼụlọ Onisiferọs.
2TI 4:20 Erastọs nọ na Kọrint, ma ahapụrụ m Trofimọs na Melitọs nʼọnọdụ ahụ esighị ike.
2TI 4:21 Jisie ike bịarute nʼebe a tupu oge oyi eruo. Yubulọs na-ekele gị, ya na Pudins, na Lainọs na Klọdia na ụmụnna anyị niile.
2TI 4:22 Ka Onyenwe anyị nọnyere mmụọ gị. Ka amara dịnyere gị.
TIT 1:1 Akwụkwọ ozi a si nʼaka m, Pọl, odibo Chineke, na onyeozi Jisọs Kraịst, onye ahọpụtara ime ka okwukwe ndị Chineke, na nghọta banyere ịmara eziokwu ahụ na-eduba na ndụ ịsọpụrụ Chineke gaa nʼihu,
TIT 1:2 nke a dabere nʼolileanya maka ndụ ebighị ebi, nke Chineke onye na-adịghị agha ụgha kwerelarị na nkwa tupu mmalite nke oge.
TIT 1:3 Mgbe oge imezu nkwa ahụ ruru, o mere ka okwu ya pụta ìhè site na nkwusa oziọma, nke e nyefere m nʼaka idebe, dị ka Chineke Onye nzọpụta anyị si nye ya nʼiwu.
TIT 1:4 Ọ bụ gị Taịtọs, ezi nwa m nwoke nʼime okwukwe nke anyị nwekọrọ. Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onye nzọpụta anyị dịrị gị.
TIT 1:5 Ahapụrụ m gị na Kriit ka i dozie ihe ụfọdụ a na-edozibeghị, ka ị họpụtakwa ndị okenye nʼobodo niile, dị ka m siri nye gị nʼiwu.
TIT 1:6 Ọ ga-abụ onye a na-enweghị ihe ịta ụta, ọ ga-abụ onye na-alụ otu nwanyị. Ụmụ ya bụ ndị kwere ekwe, ndị ama na ha anaghị ebi ndụ ọjọọ, maọbụ na-eme isiike.
TIT 1:7 Ebe ọ bụ na onye nlekọta nʼahụ ihe banyere chọọchị Chineke, ọ ga-abụ onye na-enweghị ihe ịta ụta. Ọ gaghị abụ onye nganga, onye na-ewe iwe ọkụ, onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-alụ ọgụ mgbe niile, onye hụrụ ego nʼanya.
TIT 1:8 Ọ ga-abụ onye na-anabata ndị ọbịa, na onye na-ahụ ezi ihe nʼanya. Ọ ga-abụ onye na-akwanyere onwe ya ugwu, ezi mmadụ ụzọ ya kwụ ọtọ, onye dị nsọ, na onyeisi zuruoke.
TIT 1:9 Ọ ga-abụkwa onye jidesiri oziọma ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi aka ike dịka eziri ya. Nke ga-eme ka o nwe ike gbaa ndị ọzọ ume site na ozizi ahụ nke zuruoke, nakwa ịtụ ndị ahụ na-eguzogide ya mmehie ha nʼihu.
TIT 1:10 Nʼihi na e nwere ọtụtụ mmadụ ndị na-ekweghị, ndị na-ekwu okwu efu, na ndị aghụghọ, nke ka nke, ndị si nʼotu ndị obibi ugwu pụta.
TIT 1:11 Aghaghị ịkwụsị ha maka na ha na-akụzi ihe ha ekwesighị ikuzi nʼihi ego, si otu ahụ na-eme ka ọtụtụ ezinaụlọ gbasaa.
TIT 1:12 Ọ bụ otu onye nʼime ha, onye bụkwa onye amụma ha kwuru okwu banyere ha sị, “Ndị Kriit niile bụ ndị ụgha. Ha kwara obi nʼazụ dị ka anụ ọhịa jọrọ njọ. Ha bụ ndị umengwụ nwere akpịrị ogologo.”
TIT 1:13 Nʼezie, okwu a bụ eziokwu. Nʼihi nke a, baara ha mba nʼolu ike banyere mmehie ha ka ha nwee ike zuo oke nʼokwukwe,
TIT 1:14 ka ha kwụsị ige ntị nʼakụkọ ifo ndị Juu na-akọ, maọbụ iwu nke ndị jụrụ ịnabata eziokwu nyere.
TIT 1:15 Ihe niile dị ọcha nʼebe ndị dị ọcha nọ, o nweghị ihe ọbụla dị ọcha nʼebe ndị rụrụ arụ na ndị na-ekweghị ekwe nọ. Nʼihi na uche ha na akọnuche ha rụrụ arụ.
TIT 1:16 Ha na-ekwupụta na ha maara Chineke, ma ha ji omume ha na-agọnarị ya. Ha bụkwa ndị na-akpọ mmadụ ibe ha asị, ndị isiike, na ndị na-adịghị ike nʼezi ọrụ ọbụla.
TIT 2:1 Nʼakụkụ nke gị, na-akụzi ihe kwesiri eziokwu nke okwukwe.
TIT 2:2 Gwa ndị okenye nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuruoke, ka ha bụrụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nʼanya, na ndị nwekwara ntachiobi.
TIT 2:3 Nʼotu aka ahụ, gwa ndị okenye nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-agba asịrị maọbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya oke. Kama ha na-akụzi ihe dị mma.
TIT 2:4 Ha ga-esi otu a kuziere ụmụ agbọghọ ka ha ga-esi hụ di ha na ụmụ ha nʼanya.
TIT 2:5 Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuruoke, ndị dị ọcha nʼobi, ndị na-edozi ezinaụlọ di ha, ndị na-eme ebere, ndị na-edo onwe ha nʼokpuru di ha, ka onye ọbụla ghara ikwulu okwu Chineke.
TIT 2:6 Nʼotu ụzọ ahụ kwa, gbaakwa ụmụ okorobịa ume ka ha jide onwe ha.
TIT 2:7 Nʼihe niile ị na-eme, mee onwe gị ihe ịma atụ ndị ọzọ ga na-eṅomi nʼime ezi omume. Na nkuzi gị niile, gosikwa izuoke na ikwesi ntụkwasị obi.
TIT 2:8 Ka ozi gị bụrụ nke kwụ ọtọ mmadụ apụghị ịma ikpe, ka ihere mee onye na-agbagha gị okwu, ebe ọ bụ na onweghi ihe ọjọọ ọ ga-ekwu gbasara anyị.
TIT 2:9 Gwa ndị ohu ka ha na-erubere ndị nwe ha isi, ka ha na-eme ihe ga-atọ onyenwe ha ụtọ mgbe niile. Ka ha hapụ ịsa ndị nwe ha okwu,
TIT 2:10 ka ha ghara izu ohi, kama ka ha gosi na ha bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Nʼụzọ dị otu a, ha ga-ewetara ihe anyị na-akụzi maka Chineke Onye nzọpụta anyị otuto nʼihe niile ha na-eme.
TIT 2:11 Nʼihi na Chineke emela ka amara ya nke wetaara mmadụ niile nzọpụta pụta ìhè.
TIT 2:12 Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị ka anyị jụ ndụ asọpụrụghị Chineke na nke ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nʼụwa, kama ka anyị bie ndụ dị ka ndịisi zuruoke na ndụ ezi omume, nakwa ịtụ egwu Chineke nʼọgbọ nke oge a.
TIT 2:13 Otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzị bụ ọbịbịa nke otuto nke Chineke anyị dị ukwuu, na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst.
TIT 2:14 Ọ bụ ya jiri onwe ya chụọ aja nʼihi anyị, ka ọ gbapụta anyị site nʼajọ omume anyị niile, na ido ndị ga-abụ ndị nke ya ọcha nye onwe ya, ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma mgbe niile.
TIT 2:15 Na-akụzi ihe ndị a, werekwa ha na-adụ ndị gị ọdụ site nʼikike niile i nwere. Werekwa ha na-atụ ha mmehie ha nʼihu. Ka mmadụ ọbụla ghara ilelị gị anya.
TIT 3:1 Chetara ndị nke gị ka ha doo onwe ha nʼokpuru ndịisi na ndị ọchịchị, ka ha rubere ha isi, dịkwa njikere ịrụ ọrụ ọma ọbụla.
TIT 3:2 Gwa ha ka ha ghara ikwulu onye ọbụla, ka ha gharakwa ịlụ ọgụ, kama, ka ha bụrụ enyi mmadụ niile, na-egosikwa ịdị nwayọọ ha nʼebe mmadụ niile nọ.
TIT 3:3 Nʼihi na mbụ, anyị onwe anyị bụ ndị nzuzu, ndị na-enupu isi, na ndị na-enweghị uche. Anyị bụ ohu agụụ ihe ọjọọ, na ihe ụtọ dị iche iche. Anyị biri ndụ obi ọjọọ na ekworo, na ịkpọrịta onwe anyị asị.
TIT 3:4 Ma mgbe obiọma na ịhụnanya Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ihe,
TIT 3:5 ọ zọpụtara anyị, ma ọ bụghị nʼihi ezi ihe ndị anyị mere, kama ọ bụ site nʼebere ya. Ọ zọpụtara anyị site na nsacha nke ịmụ ọzọ na nnwogharị nke Mmụọ Nsọ,
TIT 3:6 onye ọ wụsara anyị nʼuju site nʼOnye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst,
TIT 3:7 ka ọ bụrụ na ebe e sitere nʼamara gụọ anyị dịka ndị ezi omume, anyị ga-abụ ndị nketa, ndị nwere olileanya ndụ ebighị ebi.
TIT 3:8 Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-amasị m ma i kwusie ihe ndị a ike, ka ndị kweere na Chineke, lezie anya nʼịrụ ezi ọrụ. Ihe ndị a dị mma na-abakwara mmadụ uru.
TIT 3:9 Ma zere ịrụ ụka nzuzu na ịgụ agbụrụ ọmụmụ, esemokwu niile, na ọgụ niile ndị mmadụ na-alụ banyere iwu. Ihe ndị a niile abaghị uru ọbụla, ha bụ ihe efu.
TIT 3:10 Gbasara onye na-akpa oke, ị dụchaa ya ọdụ ihe dịka otu ugboro maọbụ abụọ, leghara ya anya.
TIT 3:11 Ebe ị ma na onye dị otu a bụ onye ndahie na onye ajọọ omume, o jirila aka ya maa onwe ya ikpe.
TIT 3:12 Ana m akwado izitere gị Atemas maọbụ Taịkikọs. Gbalịa bịakwute m na Nikopolis, maka nʼebe ahụ ka m kpebiri ịnọ nʼoge oyi.
TIT 3:13 Gbaa mbọ zipụ Zenas bụ onye ọkaikpe, na Apọlọs, ngwangwa nʼije ha. Hụkwa na ha ji ihe niile dị ha mkpa.
TIT 3:14 Nʼihi na ọ dị mkpa ka ndị anyị mụta inyere ndị niile chọrọ enyemaka ha aka. Ọ bụ nke a ga-eme ka ha bụrụ ndị na-amị mkpụrụ.
TIT 3:15 Ndị niile mụ na ha nọ nʼebe a na-ekele gị. Kelekwara anyị ndị niile hụrụ anyị nʼanya nʼime okwukwe. Ka amara dịnyere unu niile.
PHM 1:1 Pọl, onye e tinyere nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na site nʼaka nwanna anyị Timoti, Anyị na-edetara gị ya ezi enyi anyị na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, Fịlịmọn.
PHM 1:2 Anyị na-edetakwara ya nzukọ Kraịst dị nʼụlọ gị, na nwanna anyị nwanyị Afịa, na Akipos onye anyị na ya so na-alụ agha a.
PHM 1:3 Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị unu.
PHM 1:4 Ana m ekele Chineke ekele mgbe ọbụla m na-echeta gị nʼekpere niile m na-ekpe.
PHM 1:5 Nʼihi na ana m anụ ihe banyere okwukwe i nwere nʼime Onyenwe anyị Jisọs, na ịhụnanya i na-egosi ndị nsọ niile.
PHM 1:6 Ekpere m na-ekpe banyere gị bụ ka mmekọrịta anyị na gị dịka ndị kwere ekwe, mee ka ị matazuo ihe ọma niile anyị nwere nʼime Kraịst.
PHM 1:7 Ịhụnanya gị na-enye m oke ọṅụ na ịgbaume, ezi nwanna m, nʼihi na emeela ka ndị nsọ nwee ume ọhụrụ site nʼinyeaka gị.
PHM 1:8 Ọ bụ ezie na-enwere m ike nʼime Kraịst inye gị iwu banyere ihe kwesiri ka i mee, ma agaghị m eme otu a.
PHM 1:9 Kama, ọ kaara m mma site na ndabere nke ịhụnanya, ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ na onye mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-arịọ gị arịrịọ a.
PHM 1:10 Biko, arịọ m gị nʼisi Onisimọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m oge m nọ nʼụlọ mkpọrọ.
PHM 1:11 Na mbụ, o nweghị uru ọbụla ọ baara gị, ma ugbu a, ọ baara mụ na gị uru.
PHM 1:12 Ana m ezighachiri gị ya ugbu a, ya bụ, onye bụ obi m ka m na-ezitere gị.
PHM 1:13 Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nʼebe a, ka o were ọnọdụ gị na-ejere m ozi ọ bụladị dị ka m nọ na mkpọrọ nʼihi oziọma.
PHM 1:14 Ma, a chọghị m ime ihe ọbụla na-enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka i mere obiọma gị na mmanye. Kama, achọrọ m ka i mee ihe si gị nʼobi pụta.
PHM 1:15 Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi.
PHM 1:16 Ọ bụghịkwa ohu ọzọ, kama ọ karịrị ohu, maka ọ dịka nwanna a hụrụ nʼanya, ọkachasị nʼebe mụ onwe m nọ, ma ọ ga-abụkwara gị karịchasịa, ma nʼanụ ahụ nakwa nʼime Onyenwe anyị.
PHM 1:17 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ị gụrụ m dị ka onye nnwekọ ihe, nabata ya dị ka ị ga-esi nabata m.
PHM 1:18 Biko, ọ bụrụ na o mejọrọ gị nʼụzọ ọbụla, ọ bụrụkwa na o ji ụgwọ ọbụla, gụọ ya dị ka ụgwọ m ji gị.
PHM 1:19 Mụ bụ Pọl ji aka m dee nke a; aga m akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nʼihi na ụgwọ i ji m bụ gị onwe gị.
PHM 1:20 Nwanna m, mere m ihe a m na-arịọ gị nʼihi Onyenwe anyị. Mekwa ka obi m dị ọhụrụ nʼime Kraịst.
PHM 1:21 Olileanya m siri m ike na ị ga-aṅa m ntị, ana m edere gị akwụkwọ a, na ị ga-eme, ma karịakwa ka m rịọrọ.
PHM 1:22 Ihe ọzọkwa, bụ na m chọrọ ka ị kwadoro m ọnụụlọ ebe m ga-anọ dị ka ọbịa ma m bịa, maka enwere m olileanya na a ga-aza ekpere unu ime ka m si nʼebe a pụta bịakwute unu.
PHM 1:23 Epafras, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-ekele gị.
PHM 1:24 Mak, na Arịstakọs, na Dimas, na Luk, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-ekelekwa unu.
PHM 1:25 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.
HEB 1:1 Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche.
HEB 1:2 Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya.
HEB 1:3 Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe.
HEB 1:4 Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha.
HEB 1:5 Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị”? Maọbụ ọzọkwa, “Aga m abụrụ ya Nna, ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”?
HEB 1:6 Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.”
HEB 1:7 O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị, “Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku, na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.”
HEB 1:8 Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị, “Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ.
HEB 1:9 Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.”
HEB 1:10 Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
HEB 1:11 Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide. Ha niile ga-aka nka dịka uwe.
HEB 1:12 Ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha dị ka akwa. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.”
HEB 1:13 O nweela mmụọ ozi ọbụla ọ sịrị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị”?
HEB 1:14 Ndị mmụọ ozi niile, ha abụghị mmụọ ndị na-ejere Chineke ozi, ndị a na-ezipụ ka ha jee ozi nʼihi ndị ahụ ga-eketa nzọpụta?
HEB 2:1 Ya mere, anyị aghaghị ilezi anya nke ọma banyere ihe anyị nụrụla, ka anyị hapụ isi na ha wezuga onwe anyị.
HEB 2:2 Nʼihi na ọ bụrụ na ozi ahụ e ziri site na ndị mmụọ ozi dị ire, ọ bụrụkwa na njehie maọbụ nnupu isi ọbụla natara ahụhụ kwesiri ya.
HEB 2:3 Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya.
HEB 2:4 Chineke nʼonwe ya tụkwasịrị ịgba ama nke ya, site nʼịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche, nakwa ikesa ọtụtụ onyinye nke Mmụọ Nsọ, dị ka ọchịchọ ya siri dị.
HEB 2:5 Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa.
HEB 2:6 Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ, “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya?
HEB 2:7 Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ; i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze,
HEB 2:8 dokwaa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Mgbe o mere ka ihe niile dịrị nʼokpuru ya, o nwekwaghị ihe ọbụla ọ hapụrụ itinye nʼokpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ka e doro ihe niile nʼokpuru ya.
HEB 2:9 Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile.
HEB 2:10 Ebe e sitere na ya kpọbata ọtụtụ ụmụ nʼebube, o ziri ezi ka Chineke, onye ihe niile dịrị na onye kere ihe niile, mee ka onyeisi nzọpụta ha bụrụ onye zuruoke site nʼahụhụ ọ hụrụ.
HEB 2:11 Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya.
HEB 2:12 Ọ sịrị, “Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m, nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.”
HEB 2:13 Ọzọkwa, “Aga m atụkwasị obi m na ya.” Ọzọkwa, ọ sịrị, “Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.”
HEB 2:14 Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu.
HEB 2:15 Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile.
HEB 2:16 Nʼihi na nʼezie, ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka kama ọ bụ ụmụ ụmụ Ebraham.
HEB 2:17 Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile.
HEB 2:18 Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.
HEB 3:1 Ya mere, ụmụnna m dị nsọ, ndị so keta oke nʼọkpụkpọ eluigwe ahụ, ka echiche unu dịgide naanị na Jisọs. Onyeisi ozi na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị.
HEB 3:2 O kwesiri ntụkwasị obi nye onye ahụ họpụtara ya dịka Mosis si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼije ozi ya nʼụlọ Chineke.
HEB 3:3 Ma Jisọs nwere ugwu na nsọpụrụ karịa Mosis, dịka onye na-ewu ụlọ si enwe ugwu na nsọpụrụ karịa ụlọ o wuru.
HEB 3:4 Nʼihi na ụlọ ọbụla nwere onye wuru ya, maọbụ Chineke na-ewu ihe niile.
HEB 3:5 Mosis kwesiri ntụkwasị obi dịka odibo nʼụlọ Chineke nʼihe niile, sịkwa otu a gbaa ama banyere ihe ndị a ga-ekwu nʼọdịnihu.
HEB 3:6 Ma otu ọ dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma ọ bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi.
HEB 3:7 Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị, “Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa,
HEB 3:8 unu emela ka obi unu sie ike, dị ka unu mere nʼoge nnupu isi mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara,
HEB 3:9 ebe nna nna unu ha nọrọ nwa m ọnwụnwa. Ọ bụ ezie na ha hụrụ akaọrụ m iri afọ anọ ndị a.
HEB 3:10 Nʼihi nke a, ewere m iwe megide ọgbọ ahụ. Asịrị m, ‘Obi ha na-akpafu akpafu mgbe niile. Ha amatabeghị ụzọ m niile.’
HEB 3:11 Ya mere, aṅụrụ m iyi nʼiwe m, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ”
HEB 3:12 Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa.
HEB 3:13 Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike.
HEB 3:14 Anyị bụ ndị anyị na Kraịst ga-eso kekọrịta oke ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ya ike bụ ntụkwasị obi ahụ anyị nwere site na mmalite ruo ọgwụgwụ.
HEB 3:15 Dị ka e kwuru ya, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya. Unu emela ka obi unu sie ike, dịka unu mere nʼoge nnupu isi.”
HEB 3:16 Olee ndị bụ ndị ahụ nụrụ ma nupu isi? Ọ bụ na ọ bụghị ndị niile ahụ Mosis dupụtara site nʼala Ijipt?
HEB 3:17 Ọ bụkwa olee ndị ka o wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mehiere. Ndị ahụ ahụ ha dara nʼọzara?
HEB 3:18 Olee ndị ahụ ọ ṅụụrụ iyi na ha agaghị aba nʼizuike ya? Ọ bụ na ha abụghị ndị ahụ nupuuru ya isi?
HEB 3:19 Ugbu a, anyị maara na ha enweghị ike ịbanye, nʼihi na ha bụ ndị na-ekweghị ekwe.
HEB 4:1 Ya mere, ebe ọ bụ na nkwa nke ịba nʼizuike ya ka ghere oghe, ka anyị kpachapụ anya hụ na o nweghị onye ọbụla a ga-ahụta dịka onye etozughị ya.
HEB 4:2 Nʼihi na-eziela anyị oziọma ahụ, dị ka ezikwara ha: ma oziọma ahụ ha nụrụ abaraghị ha uru nʼihi na ha ejighị okwukwe nara ya.
HEB 4:3 Ma anyị bụ ndị kweere na-abanye nʼebe izuike ahụ, dị ka Chineke si kwuo, “Aṅụrụ m iyi nʼiwe m, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ” O kwuru nke a nʼagbanyeghị na ọ rụchaala ọrụ ya site na ntọala ụwa.
HEB 4:4 Nʼihi nʼotu ebe, o nweela ihe o kwuru banyere ụbọchị nke asaa site nʼokwu ndị a: “Chineke zuru ike site nʼọrụ ya niile, nʼụbọchị nke asaa.”
HEB 4:5 Ma nʼebe a kwa, e kwuru, “Ha agaghị abanye nʼebe izuike m ma ọlị.”
HEB 4:6 Ebe ọ bụ na ohere dịịrị ụfọdụ mmadụ ịbanye nʼime ya, ma ndị ahụ buru ụzọ nata oziọma ahụ abanyeghị nʼihi nnupu isi.
HEB 4:7 O wepụtara ụbọchị ọzọ nke ọ kpọrọ Taa, o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu ahụ e kwurula ihe banyere nʼoge gara aga sị, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, unu emela ka obi unu sie ike.”
HEB 4:8 Nʼihi na a sị na Joshua nyere ha ezumike, ọ gaghị ekwu banyere ụbọchị ọzọ.
HEB 4:9 Otu ụbọchị izuike fọdụrụ nye ndị nke Chineke.
HEB 4:10 Nʼihi na onye ọbụla banyere nʼezumike ya esitela nʼọrụ nke ya onwe ya nwee izuike dị ka Chineke siri banye nʼizuike nke ya.
HEB 4:11 Ya mere, ka anyị mee ka ike anyị ha, ka anyị banye nʼebe izuike ahụ, ka ọ hapụ ịdịkwa onye ọbụla nke na-agaghị aba nʼihi ịṅomi ekweghị ekwe ha.
HEB 4:12 Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.
HEB 4:13 Ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe niile e kere eke pụrụ izo onwe ya site nʼebe Chineke nọ. Ihe niile ghere oghe, ma gbarakwa ọtọ nʼihu anya ya. Ọ bụ nʼihu ya ka anyị niile ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị niile.
HEB 4:14 Ebe ọ bụ na anyị nwere onyeisi nchụaja dị ukwuu, onye nke gaferela nʼeluigwe, Jisọs Ọkpara Chineke, ka anyị jidesienụ okwukwe anyị ike.
HEB 4:15 Nʼihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara ya ọnwụnwa nʼụzọ niile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma, o meghị mmehie nʼụzọ ọbụla mgbe a nwara ya.
HEB 4:16 Ya mere, ka anyị bịaruo ocheeze amara ahụ nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nʼoge mkpa.
HEB 5:1 A na-esite nʼetiti ndị mmadụ họrọ onyeisi nchụaja ọbụla, ka ọ nnọchite anya ndị mmadụ nʼihe banyere ife Chineke, ka ọ na-eche onyinye na-achụkwa aja maka mmehie dị iche iche.
HEB 5:2 Ebe ọ bụ na ya onwe ya bụ onye na-adịghị ike, ọ pụrụ iji nwayọọ na-emeso ndị na-amaghị ihe na ndị na-ejehie ụzọ omume.
HEB 5:3 Nʼihi nke a, ọ ghaghị ịchụ aja maka mmehie nke onwe ya na nke ndị mmadụ.
HEB 5:4 O nweghị onye na-ewere ugwu a nʼonwe ya, kama ọ bụ Chineke na-akpọ dịka o si kpọọ Erọn.
HEB 5:5 Nʼotu aka ahụ kwa, Kraịst enyeghị onwe ya ebube nke ịbụ onyeisi nchụaja, kama Chineke sịrị ya, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị.”
HEB 5:6 Nʼebe ọzọ, o kwuru, “Dị ka usoro Melkizedek si dị, ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.”
HEB 5:7 Mgbe ọ ka dị ndụ nʼanụ ahụ, o ji oke olu na anya mmiri kpee ekpere rịọkwa arịrịọ nye onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya site nʼọnwụ. A nụkwara olu ya nʼihi ndụ nrube isi na mweda nʼala ya.
HEB 5:8 Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara ma ọ mụtara irube isi site nʼahụhụ ọ tara.
HEB 5:9 Ma mgbe e mere ka o zuo oke, ọ ghọrọ isi nke nzọpụta ebighị ebi nye ndị niile na-erubere ya isi.
HEB 5:10 Ebe Chineke mere ya onyeisi nchụaja nʼusoro Melkizedek.
HEB 5:11 Ọ dị ọtụtụ ihe ọzọ anyị nwere ikwu banyere ya, ma o siri ike ịkọwa ya nʼihi na unu adịghị amụta ihe ọsịịsọ.
HEB 5:12 Nʼezie, ugbu a, unu kwesiri ịbụ ndị ozizi nye ndị ọzọ, ma unu ka nọ na-achọ onye ga-ezikwa unu ụkpụrụ mbụ nke okwu Chineke. Unu na-achọ mmiri ara kama nri siri ike.
HEB 5:13 Onye ọbụla nke na-aṅụ ara, ka bụ nwantakịrị, ọ matabeghị ozizi banyere ezi omume.
HEB 5:14 Nri dị ike dịrị ndị tozuru oke, ndị siterela nʼihe ha na-eme zụọ onwe ha ịchọpụta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe.
HEB 6:1 Ya bụ ka anyị na-aga nʼihu nʼihe mmụta zuru ezu, ka anyị gharakwa ịnọgide nʼihe mmụta mbụ ahụ nke anyị nwere banyere Kraịst. Anyị agaghị alaghachi azụ ịtọ ntọala nchegharị ọzọ site nʼọrụ ndị nwụrụ anwụ nʼokwukwe nʼebe Chineke nọ,
HEB 6:2 na-akụzi banyere ime baptizim na ibikwasị aka nʼisi na onyinye nke Mmụọ Nsọ, na mbilite nʼọnwụ na ikpe ebighị ebi.
HEB 6:3 Anyị ga-eme nke a ma Chineke kwe.
HEB 6:4 Ma ọ dịghị mfe ịkpọghachi ndị dara ada ọzọ, bụ ndị natarala ihe ahụ na mbụ, ndị detụkwara onyinye amara dị iche iche nke si nʼeluigwe bịa ire, ndị ketakwara oke Mmụọ Nsọ,
HEB 6:5 ndị detụkwara ịdị mma nke okwu Chineke ahụ ire na ike nke ụwa na-abịa,
HEB 6:6 ma mesịa dahie nʼonwe ha, ọ bụ ihe siri ike ịkpọghachite ha ruo nchegharị. Ha na akpọgidekwa Ọkpara Chineke nʼobe ọzọ, na emenyekwa ya ihere nʼihu ọha mmadụ.
HEB 6:7 Nʼihi na ala ahụ nke na-amị mmiri na-ezokwasị nʼelu ya mgbe niile, na-amịpụta mkpụrụ bara ụba nye ndị e ji maka ha kọọ ya, na-enweta ngọzị nʼaka Chineke.
HEB 6:8 Ma ọ bụrụ na o puo naanị ogwu na ahịhịa, ọ baghị uru ọbụla. Kama, ọ ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ, nke ọgwụgwụ ya ga-abụ ịkpọ ya ọkụ.
HEB 6:9 Ma ọ bụ ezie na anyị na-ekwu otu a, ezi ndị enyi m, anyị nwere ntụkwasị obi maka ihe dị ezi mma banyere unu, bụ ihe ndị ha na nzọpụta so bịa.
HEB 6:10 Chineke abụghị onye na-ekpe ikpe nʼezighị ezi. Ọ gaghị echefu ọrụ niile unu rụrụ ya. Ọ gaghị echefu ịhụnanya niile unu gosiri nʼihi ya site nʼịgara ndị nsọ ozi, dịka unu na-aga nʼihu na-emekwa.
HEB 6:11 Anyị chọrọ ka onye ọbụla nʼime unu nọgidesie ike nʼotu ịnụ ọkụ nʼobi ahụ ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka unu nwee olileanya inwezu ihe niile unu na-atụ anya ya mgbe oge ruru.
HEB 6:12 Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama ka unu bụrụ ndị na-eṅomi ndụ ahụ jiri okwukwe na ntachiobi nweta ihe ahụ e kwere na nkwa.
HEB 6:13 Mgbe Chineke kwere Ebraham nkwa, o ji onwe ya ṅụọ iyi, nʼihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ukwuu karịa ya,
HEB 6:14 na-asị, “Nʼezie aga m agọzi gị, nyekwa gị ọtụtụ ụmụ ụmụ.”
HEB 6:15 Ebraham nwere ndidi, natakwa ihe e kwere ya na nkwa.
HEB 6:16 Ụmụ mmadụ na-eji ndị ka ha ukwuu ṅụọ iyi, iyi aṅụrụ nʼụzọ dị otu a na-eme ka ihe e kwuru guzosie ike ma wezugakwa ịrụ ụka niile nʼetiti mmadụ.
HEB 6:17 Ya mere, mgbe Chineke chọrọ igosi ndị ahụ ga-eketa nkwa ahụ, ụdịdị izuzu ya, o jiri ịṅụ iyi mee ka o doo ha anya na izuzu ya adịghị agbanwe agbanwe.
HEB 6:18 Ka ọ ga-abụ site nʼihe abụọ na-enweghị mgbanwe, nke na-agaghị ekwe omume izi Chineke dịka onye ụgha, anyị bụ ndị gbara ọsọ ndụ ga-enweta agbamume siri ike iji jide olileanya e dobeere anyị.
HEB 6:19 Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka nke mkpụrụobi nke guzosiri ike ma bụrụkwa nke e chekwara. Ọ na-abanye nʼime ime ebe nchụaja ahụ nʼazụ akwa mgbochi
HEB 6:20 ebe Jisọs onye buru anyị ụzọ, abanyela nʼihi anyị; ọ ghọlara anyị onyeisi nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị.
HEB 7:1 Melkizedek a bụ eze Salem, bụrụkwa onye nchụaja Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ọ zutere Ebraham mgbe o si na mmeri o meriri ọtụtụ ndị eze ahụ na-alọghachi, gọziekwa ya.
HEB 7:2 Ebraham nyekwara ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. Ihe mbụ aha ya pụtara bụ, “eze ezi omume,” ọzọkwa bụ “eze nke Salem,” nke pụtara, “eze udo.”
HEB 7:3 O nweghị nna, o nwekwaghị nne, nke ọ na-enwe agbụrụ. O nweghị mmalite nke ụbọchị a mụrụ ya, maọbụ ọgwụgwụ ndụ, e mere ya dị ka Ọkpara Chineke. Ọ na-anọgide bụrụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.
HEB 7:4 Leenụ otu o siri bụrụ onye dị ukwuu, ọ bụladị Ebraham bụ nna nna anyị nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼihe ọ kwatara nʼagha!
HEB 7:5 Ma otu ọ dị, iwu kwadoro ka ụmụ Livayị bụ ndị ghọrọ ndị nchụaja na-anakọta otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼaka ndị ọzọ, ya bụ, site nʼaka ndị ụmụnna ha ndị Izrel, nʼagbanyeghị na ụmụnna ha ndị ahụ bụkwa ụmụ ụmụ Ebraham.
HEB 7:6 Ma nwoke a bụ onye na-esiteghị nʼagbụrụ naara otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼaka Ebraham ma gọziekwa ya bụ onye ahụ nke natara nkwa ahụ.
HEB 7:7 O nweghị ịrụrịta ụka ọbụla dị ya, na onye dị ukwuu na-agọzi onye dị nta.
HEB 7:8 Nʼotu aka ahụ, ndị na-anata otu ụzọ nʼụzọ iri bụ mmadụ na-anwụ anwụ, ma nʼaka nke ọzọ, onye na-anata ya bụ onye ahụ e kwupụtara na ọ na-adị ndụ.
HEB 7:9 Mmadụ pụrụ isi na Livayị onye natara otu ụzọ nʼụzọ iri kwụrụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ya site nʼaka Ebraham.
HEB 7:10 Nʼihi na mgbe Melkizedek zutere ya, ọ ka nọ nʼafọ nna nna ya.
HEB 7:11 Ọ bụrụ na a pụrụ ime ka mmadụ zuo oke site nʼọnọdụ ndị nchụaja ndị Livayị, nʼihi na ọ bụ site nʼiwu e nyere ndị mmadụ ka e ji hiwee ọnọdụ ndị nchụaja. Olee uru ọ bara ka onye nchụaja ọzọ bịa, dị ka usoro Melkizedek si dị, na-abụghị dị ka usoro nke Erọn?
HEB 7:12 Ebe a gbanwere ọnọdụ ndị nchụaja, nʼotu aka ahụ, a ghaghị ịgbanwekwa iwu.
HEB 7:13 Nʼihi na onye ahụ e kwuru ihe ndị a banyere ya sitere nʼagbụrụ ọzọ, nke ọ dịbeghị onye ọbụla sitere na ya rụrụ ọrụ dị nʼebe ịchụ aja.
HEB 7:14 Ọ bụ ihe a mara nke ọma na Onyenwe anyị si nʼagbụrụ Juda pụta, Mosis nʼonwe ya akpọtụghị agbụrụ ahụ aha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị nchụaja.
HEB 7:15 E meela ka a ghọta okwu anyị na-ekwu nke ọma, mgbe onye nchụaja ọzọ yiri Melkizedek pụtara.
HEB 7:16 Onye ghọrọ onye nchụaja ma ọ bụghị site nʼusoro iwu nke ọmụmụ ndị nchụaja, kama site nʼike dị na ndụ nke na-apụghị ịla nʼiyi.
HEB 7:17 Nʼihi na-agbara akaebe banyere ya, sị, “Gị onwe gị, bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, dị ka usoro Melkizedek si dị.”
HEB 7:18 Nʼotu aka ahụ, e wezugala usoro iwu ochie ahụ nʼihi adịghị ike ya na nʼihi abaghị uru ya
HEB 7:19 (nʼihi na iwu ahụ emeghị ka ihe ọbụla zuo oke), ma nʼaka nke ọzọ, e webatala olileanya ka mma, bụ nke anyị na-esite na ya bịaruo Chineke nso.
HEB 7:20 Ma e ji ịṅụ iyi mee ka ọnọdụ onyeisi nchụaja a guzosie ike. O nweghị iyi a ṅụrụ mgbe ndị ọzọ ghọrọ ndị nchụaja.
HEB 7:21 Ma onye nke a ghọrọ onye nchụaja site nʼịṅụ iyi mgbe onye ahụ gwara ya, “Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe obi ya, ‘Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.’ ”
HEB 7:22 Nʼihi nke a, Jisọs aghọọla onye na-akwagide ọgbụgba ndụ ka mma.
HEB 7:23 Ihe ọzọ, ndị nchụaja nke ochie ahụ dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nʼihi na ọnwụ gbochiri ha ịga nʼihu nʼọrụ ha.
HEB 7:24 Ya mere, ebe ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ na-abụkwa onyeisi nchụaja mgbe niile.
HEB 7:25 Ya mere o nwere ike ịzọpụta ruo mgbe niile ndị ahụ na-abịakwute Chineke site na ya, nʼihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe niile ịrịọ arịrịọ nʼihi ha.
HEB 7:26 Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe.
HEB 7:27 Ọ dịghị ka ndịisi nchụaja ndị ọzọ, nʼihi na ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja kwa ụbọchị, nʼihi mmehie nke aka ya, na nʼihi mmehie nke ndị ọzọ. Naanị otu aja nke dịrị mgbe niile ka ọ chụrụ maka mmehie mgbe o weere onwe ya nye dị ka aja.
HEB 7:28 Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi.
HEB 8:1 Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe.
HEB 8:2 Onye na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ, bụ ezi ụlọ ikwu ahụ Onyenwe anyị ji aka ya wuo, ọ bụghị mmadụ wuru ya.
HEB 8:3 A họpụtara onyeisi nchụaja ọbụla ka ọ na-achụ aja na-enyekwa onyinye. Nʼihi nke a, o kwesikwara ka ọ nwee ihe ọ ga-eji na-achụ aja.
HEB 8:4 A sịkwarị na ọ nọ nʼụwa, o garaghị a bụ onye nchụaja nʼihi na e nwere ndị nchụaja na-achụ aja dị ka usoro iwu si dị.
HEB 8:5 Ha na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ nke bụ oyiyi na onyinyo banyere ihe nke dị nʼeluigwe. Ọ bụ nke a mere e ji dọọ Mosis aka na ntị mgbe ọ na-akwado iwu ụlọ ikwu ahụ, “Lezie anya hụ na i mere ihe niile nʼusoro dị ka e si gosiri gị nʼelu ugwu.”
HEB 8:6 Ma otu ọ dị, ọ natara ọrụ ije ozi karịrị nke ha, dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ dị elu karịa nke ochie, ebe ọgbụgba ndụ nke ọhụrụ a o mere ka ọ dịrị nʼetiti ya na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa.
HEB 8:7 Ọ bụrụ na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuruoke, ọ garaghị aba uru ka achọwa ọgbụgba ndụ ọzọ.
HEB 8:8 Ma Chineke chọpụtara ezughị oke ha mgbe ọ sịrị, “Lee, oge na-abịa, ka Onyenwe anyị kwupụtara, mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda.
HEB 8:9 Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha anọgideghị bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi idebe ọgbụgba ndụ m. Nʼihi ya, echepụrụ ihu m nʼebe ha nọ, ka Onyenwe anyị kwupụtara.
HEB 8:10 Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka ọ dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel, mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m etinye iwu m nʼime uche ha, dekwasị ya nʼobi ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.
HEB 8:11 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.
HEB 8:12 Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”
HEB 8:13 Mgbe o kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ọ pụtara na nke ochie ahụ abụrụla ihe gabigara agabiga. Ihe dị ochie nke gabigara ga-emesịa ghara ịdịkwa.
HEB 9:1 Ọgbụgba ndụ nke mbụ nwere usoro ofufe na ebe nsọ nke ụwa nke a e jiri aka wuo.
HEB 9:2 E guzobere ụlọ ikwu. Nʼọnụụlọ nke mbụ nʼụlọ ikwu ahụ, e nwere ihe ịdọba iheọkụ, na tebul, na achịcha e doro nsọ. Aha ọnụụlọ nke mbụ a bụ Ebe Nsọ.
HEB 9:3 Nʼazụ akwa mgbochi nke abụọ ka e nwere ọnụụlọ a na-akpọ Ebe Kachasị Nsọ,
HEB 9:4 nke nwere ebe ịchụ aja mgbaisiọma e ji ọlaedo wuo, na igbe ọgbụgba ndụ ahụ nke e jiri ọlaedo machie ahụ ya niile. Ihe dị nʼime ite ahụ bụ mánà na mkpanaka Erọn nke ahụ puputara ahịhịa, ya na mbadamba nkume e dekwasịrị iwu ọgbụgba ndụ.
HEB 9:5 Ihe dị nʼelu igbe a bụ cherubim nke ebube ya, na-ekpuchite oche amara ahụ. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe niile ndị a nʼozuzu oke ugbu a.
HEB 9:6 Mgbe e doro ihe niile ndị a nʼusoro, onye nchụaja na-abata mgbe ọbụla nʼime ọnụụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nʼebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ.
HEB 9:7 Ma ọ bụ naanị onyeisi nchụaja na-abanye nʼime ọnụụlọ nsọ nke abụọ, naanị otu ugboro nʼafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nʼebe ahụ, iji chụọ aja maka onwe ya na nʼihi mmehie ndị mmadụ mere na-amaghị ama.
HEB 9:8 Site na nke a, Mmụọ Nsọ na-egosi na ụzọ e si abanye nʼEbe Kachasị Nsọ ahụ bụ ihe na a ka apụtabeghị ihe, ebe ọ bụ na ụlọ ikwu nke mbụ ahụ ka na-eguzo.
HEB 9:9 Nke a bụ ihe ilu banyere oge ugbu a. Site na nhazi nke a, onyinye na aja niile a na-achụ enweghị ike ime ka akọnuche onye na-efe ofufe zuo oke.
HEB 9:10 Kama ha bụ naanị usoro iwu metụtara ihe oriri na ihe ọṅụṅụ na ụdị baptizim dị iche iche nke anụ ahụ, bụ nke e nyere ka a na-eme ya ruo mgbe a ga-edozigharị ihe niile.
HEB 9:11 Mgbe Kraịst bịara dị ka onyeisi nchụaja nke ezi ihe ahụ dị ugbu a, site nʼụlọ ikwu dị ukwuu zuruoke nke a na-ejighị aka mee, nke na-esoghị nʼihe e kere eke,
HEB 9:12 o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi.
HEB 9:13 Ma ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oke ehi dị iche iche, ya na ntụ nwa agbọghọ ehi, nke e fekwasịrị ndị rụrụ arụ, pụrụ ido ha nsọ, meekwa ka ha dị ọcha nʼelu ahụ.
HEB 9:14 Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ.
HEB 9:15 Nʼihi nke a, ọ bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ site na ya nata ihe nketa ebighị ebi ahụ bụ nke e kwere ha na nkwa. A pụrụ ime nke a nʼihi ọ nwụọla ọnwụ gbapụta ụmụ mmadụ site nʼikpe ọmụma nke mmehie ha mere nʼokpuru ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ.
HEB 9:16 Ọ bụrụ na mmadụ ekee ekpe mgbe ọ nọ ndụ, a na-ebu ụzọ achọpụta ma onye kere ekpe ahụ ọ nwụọla.
HEB 9:17 Ekpe na-amalite ịdị ire mgbe onye kere ekpe ahụ nwụrụ, nʼihi na ihe mmadụ kere nʼekpe anaghị adị ire mgbe onye kere ya ka dị ndụ.
HEB 9:18 Ọ bụ nke a mere ọ bụladị ọgbụgba ndụ ochie ahụ jiri bụrụ ihe na-adịghị ire ruokwa mgbe ọbara batara na ya.
HEB 9:19 Mgbe Mosis kwupụtachara ndị mmadụ iwu ahụ, o weere ọbara ụmụ ehi na ewu, ya na mmiri, ogbo uhie na hisọp fesaa nʼakwụkwọ iwu ahụ nakwa nʼelu mmadụ niile.
HEB 9:20 Na-ekwu, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke Chineke nyere unu iwu.”
HEB 9:21 Nʼotu aka ahụ, o fesakwara ọbara ahụ nʼelu ụlọ ikwu na nʼelu ihe niile dị nʼụlọ ikwu, bụ ihe niile e ji efe ofufe.
HEB 9:22 Nʼikwu eziokwu, dịka iwu si dị, ọ dịghị ihe ọbụla nke a na-adịghị eji ọbara edo ọcha. Ọ bụrụ na a wụsịghị ọbara, mgbaghara mmehie adịghị.
HEB 9:23 O kwesiri ka e si otu a mee ka ihe ndị a yiri ihe ndị dị nʼeluigwe dị ọcha, ma ihe ndị dị nʼeluigwe nʼonwe ha kwesiri ka e nye ha aja dị mma karịa.
HEB 9:24 Nʼihi na ọ bụghị nʼebe nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, nke yiri nke dị nʼeluigwe, ka Kraịst banyere, kama ọ banyere nʼime eluigwe nʼonwe ya, bụ ebe ọ na-anọchite anya anyị ugbu a nʼihu Chineke.
HEB 9:25 Ọ banyeghị na ya ka o were onwe ya chụọ aja ọtụtụ ugboro, dị ka onyeisi nchụaja na-eji ọbara na-abụghị nke ya na-abanye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ kwa afọ.
HEB 9:26 Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ gaara abụ onye na-ahụ ahụhụ mgbe kemgbe e kere ụwa. Ma, dị ka o si dị, ọ bịara naanị otu ugboro nʼọgwụgwụ oge ndị a, iwezuga mmehie site nʼiji onwe ya chụọ aja.
HEB 9:27 Dị ka ọ bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie,
HEB 9:28 otu a ka e si chụọ Kraịst dị ka aja naanị otu ugboro iwepụ mmehie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-abịaghachi nke ugboro abụọ, ma ọ bụghị nʼihi ibu mmehie, kama ọ bụ nʼihi iweta nzọpụta nye ndị ahụ niile na-eche ọbịbịa ya.
HEB 10:1 Iwu ahụ bụ naanị onyinyo na-egosi ihe ọma gaje ịbịa. Nʼihi ya, o zughị oke nʼonwe ya isite nʼaja ndị ahụ a na-achụ mgbe mgbe kwa afọ, mee ka ndị ahụ na-abịaru nso ife ofufe zuo oke.
HEB 10:2 Ma ọ bụghị otu a, ọ bụ na a gabeghị akwụsị ịchụ aja ndị a? Ọ bụrụ na a sachapụla njọ ndị na-efe ofufe na mbụ, akọnuche ha agaghịkwa ama ha ikpe mmehie ha.
HEB 10:3 Ma nke bụ eziokwu bụ na ihe aja ndị a na-eme bụ ichetara ha mmehie ha kwa afọ niile.
HEB 10:4 Nʼihi na ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na ọbara oke ehi na nke ụmụ ewu dị iche iche ga-asachapụ mmehie.
HEB 10:5 Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị, “Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ kama ị kwadoro ahụ nye m.
HEB 10:6 Aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie, ha abụghị ihe dị ezi mma nye gị.
HEB 10:7 Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ. Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’ ”
HEB 10:8 O kwuru na mbụ, “Aja dị iche iche, na onyinye, na aja nsure ọkụ na aja mmehie adịghị atọ gị ụtọ, ha adịghịkwa amasị gị” (a chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị).
HEB 10:9 O kwukwara ọzọ, “Lee abịala m ime uche gị.” Ọ kagburu aja nke mbụ ahụ ma were aja nke abụọ dochie nʼọnọdụ ya.
HEB 10:10 Site nʼime uche Chineke, e mere ka anyị dị nsọ site nʼaja Jisọs Kraịst ji onwe ya chụọ naanị otu ugboro.
HEB 10:11 Onye nchụaja ọbụla na-eguzo kwa ụbọchị na-efe ofufe, na-achụkwa otu aja ahụ ugboro ugboro, bụ aja nke na-enweghị ike ịsachapụ mmehie.
HEB 10:12 Ma mgbe Kraịst chụchara naanị otu aja ahụ, otu ugboro nʼihi mmehie niile, ọ nọdụrụ ala nʼaka nri Chineke.
HEB 10:13 Ebe ahụ ka ọ nọ ugbu a na-eche ka ndị iro ya niile bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya.
HEB 10:14 Nʼihi na o sitela nʼotu aja mee ka ndị ahụ a na-eme ka ha dịrị nsọ zuo oke mgbe niile.
HEB 10:15 Mmụọ nsọ na-agbakwara anyị ama banyere ihe ndị a mgbe o buru ụzọ kwuo:
HEB 10:16 “Nke a bụ ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ha ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m etinye iwu m nʼobi ha. Aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.”
HEB 10:17 O kwukwara sị, “Agaghị m echetakwa mmehie ha na mmebi iwu ha niile ọzọ.”
HEB 10:18 Ya mere, ebe ọ bụ na a gbagharala mmehie ndị a, ọ dịkwaghị mkpa ịchụ ajọ ọzọ maka mgbaghara mmehie.
HEB 10:19 Nʼihi nke a, ụmụnna m, ebe anyị nwere nkwuwa okwu ịbanye nʼEbe Kachasị Nsọ site nʼọbara Jisọs,
HEB 10:20 bụ ụzọ ọhụrụ nke o meghere nye anyị, nke dị ọhụrụ ma dịkwa ndụ site nʼakwa mgbochi ahụ nke bụ ahụ ya,
HEB 10:21 ebe anyị nwekwara onye nchụaja dị ukwuu, nke na-elekọta ụlọ Chineke,
HEB 10:22 ka anyị bịaruo nso site nʼobi dị ọcha, na ntụkwasị obi zuru ezu nke okwukwe, ka anyị bụrụ ndị a sachara obi ha site nʼakọnuche rụrụ arụ, ka anyị bụrụkwa ndị e ji mmiri dị ezigbo ọcha sachaa ahụ anyị.
HEB 10:23 Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi.
HEB 10:24 Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ.
HEB 10:25 Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso.
HEB 10:26 Ọ bụrụ na anyị akpachapụ anya na-anọgide na mmehie mgbe anyị matachara eziokwu ahụ, o nwekwaghị aja ọzọ fọdụrụ a ga-achụ banyere mmehie niile.
HEB 10:27 Kama naanị ikpe dị oke egwu, nke ga-adị ka ọkụ na-ere ike ike, nke ga-erechapụ ndị niile bụ ndị iro.
HEB 10:28 Onye ọbụla dara iwu Mosis, na-anwụ na-enweghị ebere, site nʼakaebe mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara megide ya.
HEB 10:29 Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ụdị ahụhụ unu chere na a ga-enye onye lelịrị Ọkpara Chineke, gịnị ka a ga-eme onye merụrụ ọbara nke ọgbụgba ndụ nke e ji doo ya nsọ, na onye kpasuru mmụọ nke amara ahụ iwe?
HEB 10:30 Nʼihi na anyị maa onye ahụ kwurunụ, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ọzọkwa, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.”
HEB 10:31 Ọ bụ ihe dị oke egwu ịdaba nʼaka Chineke dị ndụ.
HEB 10:32 Ma chetakwanụ ụbọchị mbụ ndị ahụ, mgbe unu natachara ìhè, unu nọgidesikwara ike nʼagbanyeghị oke ahụhụ niile unu tara.
HEB 10:33 Mgbe ụfọdụ, a kparịrị unu nʼihu ọha, unu natakwara mkpagbu. Nʼoge ọzọ, unu soro ndị e si otu a mesoo mmeso.
HEB 10:34 Unu were obi ebere soro ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ taa ahụhụ, unu jikwa ọṅụ nabata ya mgbe a nakọrọchara unu ihe niile unu nwere, nʼihi na unu onwe unu matara na unu nwere ihe ka mma, nke na-anọgide.
HEB 10:35 Ya mere, unu ahapụkwala ntụkwasị obi unu ahụ, nʼihi na ọ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.
HEB 10:36 Nʼihi ya, unu kwesiri inwe ndidi ka ọ ga-abụ na mgbe unu mere uche Chineke unu ga-anata ihe e kwere na nkwa.
HEB 10:37 Nʼihi, “Na oge na-adịghị anya, onye ahụ nke na-abịa ga-abịa ọ gaghị anọkwa ọdụ.”
HEB 10:38 Ma, “Onye ezi omume nkem ga-esite nʼokwukwe dị ndụ. Mkpụrụobi m agaghị e nwee mmasị nʼime onye ọbụla na-alaghachi azụ.”
HEB 10:39 Ma anyị abụghị ndị na-alaghachi azụ si otu a laa nʼiyi. Kama anyị dịnyere ndị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara.
HEB 11:1 Ugbu a, okwukwe bụ inwe obi ike banyere ihe ndị a na-ele anya ha na inwe owuweanya banyere ihe a na-ahụbeghị anya.
HEB 11:2 Nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka e ji gbaara ndị ochie ama.
HEB 11:3 Ọ bụ site nʼokwukwe ka anyị ji ghọta na e mere ụwa na ihe niile anyị na-ahụ anya site nʼokwu Chineke. Nʼihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nʼihe anyị na-adịghị ahụ anya.
HEB 11:4 Ebel sitere nʼokwukwe chụọ aja dị mma nye Chineke karịa aja nke Ken chụrụ; nke e si na ya gụnye ya nʼonye ezi omume. Chineke kwuru okwu banyere onyinye ya. Ma ugbu a, ọ bụ ezie na ọ nwụọlarị ma ọ ka na-ekwu okwu site nʼokwukwe.
HEB 11:5 E sitere nʼokwukwe kupu Enọk nke pụtara na ọ nwụghị anwụ, a hụkwaghị ya ọzọ nʼihi na Chineke akpọrọla ya. Ma tupu e kuru ya, e mere ka anyị mara na ọ mere ihe masịrị Chineke.
HEB 11:6 Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na ọ dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ụgwọ.
HEB 11:7 Site nʼokwukwe, Noa, onye nke a dọrọ aka na ntị gbasara ihe ndị a na-ahụbeghị anya, gere ntị ma ruo ụgbọ mmiri maka nzọpụta nke ezinaụlọ ya. Site na nke a, ọ mara ụwa ikpe, ma bụrụ onye nketa nke ezi omume sitere nʼokwukwe.
HEB 11:8 Site nʼokwukwe, Ebraham rubere isi mgbe a kpọrọ ya ka ọ hapụ, gaa nʼala ahụ nke ọ ga-enweta dịka ihe nketa. Ọ gawara nʼamaghị ebe ọ na-aga.
HEB 11:9 Okwukwe ka o jiri biri dịka ọbịa nʼala ahụ e kwere ya na nkwa, na-ebi nʼụlọ ikwu, ya na Aịzik na Jekọb, bụ ndị e kwere ya na ha otu nkwa ahụ.
HEB 11:10 Nʼihi na ọ na-ele anya ala ahụ nke nwere ntọala, nke onye tụrụ atụmatụ ya ma wuokwa ya bụ Chineke.
HEB 11:11 Site nʼokwukwe ọ natara ike ọmụmụ. Ọ bụ ezie na ọ gafeela oge ịmụta nwa, ọ bụladị Sera nʼonwe ya bụ nwanyị aga, nʼihi na ọ gụrụ onye ahụ kwere ya nkwa dị ka onye kwesiri ntụkwasị obi.
HEB 11:12 Ya mere site nʼotu onye a, onye a gụrụ dị ka onye nwụrụ anwụ ka e si nweta ụmụ ndị ọnụọgụgụ ha dị ka kpakpando dị na mbara eluigwe, dị ka aja dị nʼakụkụ osimiri.
HEB 11:13 Ndị a niile nwere okwukwe nwụrụ na-anataghị nkwa ahụ, ma site nʼebe dị anya ha hụrụ ma nabatakwa nkwa ndị a. Ha kwupụtakwara na ha bụ ndị ọbịa na ndị mba ọzọ nʼụwa.
HEB 11:14 Ndị na-ekwu otu a na-ezipụta na ha na-ele anya obodo nke aka ha.
HEB 11:15 Ọ bụrụ na ha na-eche echiche banyere obodo nke ha hapụrụ, ha gaara enwe ohere ịlaghachi azụ.
HEB 11:16 Ma otu ọ dị, ha na-elesi anya ike maka obodo ahụ ka mma, bụ nke dị nʼeluigwe. Ya mere, ọ dịghị eme Chineke ihere ka a kpọ ya Chineke ha, nʼihi na o dozielara ha ebe obibi.
HEB 11:17 Site nʼokwukwe Ebraham ji Aịzik chụọ aja mgbe a nwalere ya. Onye ahụ natara ihe ndị ahụ e kwere nkwa, dị njikere iji otu nwa ahụ o nwere chụọ aja,
HEB 11:18 ọ bụ ezie na Chineke kwuru maka ya, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.”
HEB 11:19 Ebraham chere na Chineke pụrụ ime ka onye nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie, dịka ihe ịma atụ otu ahụ ka o mekwara, nʼihi na ọ nataghachikwara ya.
HEB 11:20 Ọ bụ okwukwe ka Aịzik jiri nye Jekọb na Ịsọ ngọzị banyere ihe dị nʼihu.
HEB 11:21 Ọ bụ okwukwe ka Jekọb ji gọzie ụmụ Josef nʼotu nʼotu tupu ọ nwụọ. Ọ kpọrọ isiala dịka ọ dabere nʼelu mkpanaka ya.
HEB 11:22 Nʼọgwụgwụ ndụ ya, Josef sitere nʼokwukwe kwuo banyere ọpụpụ ụmụ Izrel ma nyekwa ntụziaka banyere olili ọkpụkpụ ya.
HEB 11:23 Okwukwe ka nne na nna Mosis ji zobe ya ọnwa atọ mgbe a mụrụ ya, nʼihi na ha hụrụ na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu eze ala Ijipt bụ Fero nyere.
HEB 11:24 Site nʼokwukwe, Mosis e kweghị aza nwa ada Fero mgbe o tolitere.
HEB 11:25 Ọ họọrọ isoro ụmụ Chineke keta oke na mmegbu ha karịa inwe aṅụrị nke mmehie.
HEB 11:26 O kpebiri na ọ bụ ihe karịchara mma ịhụ ahụhụ nʼihi Kraịst, kama inweju akụ niile nke Ijipt afọ. Nʼihi na o nwere olileanya maka ụgwọ ọrụ dị nʼihu.
HEB 11:27 Okwukwe ka ọ ji hapụ Ijipt. Ọ tụghị egwu iwe eze, ma ọ tachịrị obi ya dịka ọ hụrụ onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.
HEB 11:28 O sitekwara nʼokwukwe debe Mmemme Ngabiga. O fesara ọbara ka onye mbibi nke ụmụ nwoke mbụ, hapụ ịmetụ ụmụ nwoke mbụ ndị Izrel aka.
HEB 11:29 Ha gafere Osimiri Uhie site nʼokwukwe dị ka a ga-asị na ọ bụ ala efu. Ma mgbe ndị Ijipt nwara ime nke a, mmiri lomiri ha niile.
HEB 11:30 Mgbidi Jeriko dara mgbe ha jiri okwukwe gaa ya gburugburu ụbọchị asaa.
HEB 11:31 Site nʼokwukwe, Rehab nwanyị akwụna esoghị ndị nnupu isi laa nʼiyi nʼihi na ọ nabatara ndị bịara inyochapụta obodo ahụ nʼudo.
HEB 11:32 Olee ihe ọzọ m ga-ekwu? Oge ga-agwụnahụ m ikwu gbasara Gidiọn, na Barak, na Samsin, na Jefta, na Devid, na Samuel na ndị amụma,
HEB 11:33 ndị sitere nʼokwukwe merie ọtụtụ alaeze, kpeekwa ikpe nkwụmọtọ, natakwa nkwa e kwere, ndị mechiri ọnụ ọdụm.
HEB 11:34 Ha menyụrụ ọkụ dị egwu, gbanarị mma agha, nweta ike site nʼadịghị ike. Ha ghọkwara ndị dị ike nʼagha, chụlaa usuu ndị agha ndị mba ọzọ.
HEB 11:35 Ụmụ nwanyị natara ndị ha nwụrụ anwụ, site na mbilite nʼọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ, ha jụrụ ịnata mgbapụta ka ha nwee ike nata mbilite nʼọnwụ ka mma.
HEB 11:36 E ji ụfọdụ mere ihe ọchị, tiekwa ha ihe otiti, ọ bụladị ike ha agbụ na ịtụ ha mkpọrọ.
HEB 11:37 A tụrụ ụfọdụ nkume, kwọbie ụfọdụ abụọ. E ji mma agha gbuo ụfọdụ. Ụfọdụ yi akpụkpọ ewu na akpụkpọ atụrụ jegharịa. Ụfọdụ bụkwa ndị dara ụkpa. A kpagburu ụfọdụ, ma mejọọkwa ndị ọzọ.
HEB 11:38 Ha wagharịrị nʼọzara na nʼugwu, nʼọgba nkume na nʼọnụ ala. Nʼanya ụwa, a gụrụ ha nʼihe efu.
HEB 11:39 A gbaara ezigbo ama nʼisi ndị a niile nʼihi okwukwe ha, ma ha anataghị ihe ahụ e kwere ha na nkwa.
HEB 11:40 Otu ọ dị, Chineke akwadoberela anyị ihe kaara anyị mma, ka a ghara ime ka ha zuo oke ma e wepụ anyị.
HEB 12:1 Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu.
HEB 12:2 Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke.
HEB 12:3 Tuleenụ nʼobi unu gbasara onye ahụ tachịrị obi na nkwụgide sitere nʼaka ndị mmehie, ka ike ghara ịgwụ unu maọbụ obi unu adaa mba.
HEB 12:4 Nʼime ọgụ nke unu na-alụso mmehie, unu eguzogideghị ruo nʼọnọdụ nke iwufu ọbara unu.
HEB 12:5 Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ, “Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba.
HEB 12:6 Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.”
HEB 12:7 Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba.
HEB 12:8 Ya mere ọ bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko.
HEB 12:9 Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ.
HEB 12:10 Ha na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nʼuche ha. Ma ọ na-azụ anyị nʼihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nʼịdị nsọ ya.
HEB 12:11 Mgbe ọbụla a na-ezi anyị ihe site nʼinye anyị ahụhụ, ọ na-abụrụ anyị ihe mwute nʼoge ahụ, ọ bụghịkwa ihe ọṅụ. Ma e mesịa, ọ na-eweta udo na ndụ ezi omume nye ndụ ahụ azụrụ nʼime ya.
HEB 12:12 Ya mere, setịpụ aka gị ahụ ike gwụrụ. Guzosie ike nʼụkwụ gị ahụ na-ama jijiji.
HEB 12:13 Debenụ ụkwụ unu nʼụzọ ziri ezi, ka ụkwụ na-adịghị ike ghara ịda ngwụrọ, kama ka o nwe ọgwụgwọ.
HEB 12:14 Gbalịsie ike mee ka gị na mmadụ niile biri nʼudo ya na ndụ dị nsọ, e wepụ ya, o nweghị onye pụrụ ịhụ Onyenwe anyị.
HEB 12:15 Hụkwanụ na o nweghị onye ga-ahapụ inweta amara Chineke, na o nwekwaghị onye ga-epupụta dịka mgbọrọgwụ ilu weta nsogbu a ga-esi nʼime ya merụọ ọtụtụ mmadụ.
HEB 12:16 Hụnụ na o nweghị onye na-ebi ndụ ruru unyi maọbụ onye nke na-enweghị nsọpụrụ dịka Ịsọ, onye nke rere ọnọdụ ọmụmụ ya nʼihi otu efere nri.
HEB 12:17 Dịka unu maara, o mechara chọọ ka o keta ngọzị ahụ, ma a jụrụ ya nʼihi na o nweghị ohere nchegharị. Ọ bụ ezie na o jiri anya mmiri chọsie ya ike.
HEB 12:18 Unu abịarughị nʼugwu nke a pụrụ ịmetụ aka, nke na-ere ọkụ, na ọchịchịrị na itiri na oke ifufe,
HEB 12:19 na ụda opi ike, maọbụ olu na-ekwu okwu, nke ndị nụrụ ya rịọrọ ka ọ kwụsị ịgwa ha.
HEB 12:20 Nʼihi na ha enweghị ike ịnagide ihe e nyere nʼiwu, “A sịkwarị na anụmanụ ọbụla emetụ ugwu ahụ ahụ, a ga-eji nkume tugbuo ya.”
HEB 12:21 Nʼezie, ihe ahụ anya hụrụ dị oke egwu na Mosis sịrị, “Ana m ama jijiji nʼihi ụjọ.”
HEB 12:22 Ma unu abịaruola nʼugwu Zayọn, bụ obodo Chineke dị ndụ, Jerusalem nke eluigwe ahụ. Unu abịakwutela puku kwụrụ puku ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ zukọrọ nʼọṅụ.
HEB 12:23 Unu abịala nʼụlọ nzukọ nke onye ahụ ebu ụzọ mụpụta bụ ndị e dere aha ha nʼeluigwe. Unu abịakwutela Chineke, onye ga-ekpe mmadụ niile ikpe, unu abịakwutela mmụọ ndị ezi omume e mere ka ha bụrụ ndị zuruoke.
HEB 12:24 Unu abịakwutela Jisọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bịakwutekwa ọbara e fesara nke na-ekwu okwu dị mma karịa nke ọbara Ebel kwuru.
HEB 12:25 Gbalịsienụ ike ihu na unu ajụghị onye ahụ na-ekwu okwu. Nʼihi na ọ bụrụ na ha agbanarịghị ya, bụ onye ahụ dọrọ ha aka na ntị nʼelu ụwa, anyị agaghị agbanarị onye ahụ si nʼeluigwe na-adọ anyị aka na ntị.
HEB 12:26 Nʼoge ahụ, olu ya mere ka ụwa ma jijiji, ma ugbu a, ọ kwela nkwa, sị, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ, ọ bụghị naanị ụwa ka m ga-eme ka ọ maa jijiji kama aga m emekwa ka eluigwe maa jijiji.”
HEB 12:27 Okwu a bụ, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ,” na-egosi mwepụ nke ihe na-ama jijiji dịka ihe e kere eke, iji hụ na nke na-anaghị ama jijiji ga-adị.
HEB 12:28 Ya mere, ebe anyị na-anata alaeze nke na-apụghị ịgbanwe, ka anyị jiri obi ekele, egwu na nsọpụrụ fee Chineke ofufe nʼụzọ ọ ga-anabata.
HEB 12:29 Nʼihi na Chineke anyị bụ ọkụ na-erepịa erepịa.
HEB 13:1 Ka ịhụnanya unu nwere nʼetiti unu na-adịgide.
HEB 13:2 Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị.
HEB 13:3 Chetanụ ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nʼụlọ mkpọrọ. Chetakwanụ ndị a na-ata ahụhụ, dịka a ga-asị na unu onwe unu so ha na-ahụ ahụhụ nʼahụ unu.
HEB 13:4 Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.
HEB 13:5 Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”
HEB 13:6 Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo, “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”
HEB 13:7 Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.
HEB 13:8 Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
HEB 13:9 Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu. Nʼihi na ọ bụ ihe dị mma ka e were amara mee ka obi sie ike, ọ bụghị site nʼidebe iwu banyere nri nke na-enweghị uru ọ bara ndị na-edebe ya.
HEB 13:10 Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị niile na-eje ozi ha nʼụlọ ikwu a enweghị ike iri aja a chụrụ nʼelu ya.
HEB 13:11 Onyeisi nchụaja na-ewebata ọbara ụmụ anụ ndị ahụ nʼEbe Kachasị Nsọ dịka aja maka mmehie, ma a na-erepịa anụ ahụ ha ọkụ na mpụga ụlọ ikwu.
HEB 13:12 Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ.
HEB 13:13 Ya mere, ka anyị gakwuru ya nʼazụ ụlọ ikwu soro ya die mkparị o diri.
HEB 13:14 Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa.
HEB 13:15 Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.
HEB 13:16 Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.
HEB 13:17 Ka unu na-ekwenyere ndị ndu unu, dokwaanụ onwe unu nʼokpuru ha. Nʼihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụobi unu dịka ndị ga-aza azịza. Meenụ nke a ka ha were ọṅụ na-eje ozi ha, ma ọ bụghị site nʼobi mwute nʼihi na nke a agaghị abara unu uru.
HEB 13:18 Na-ekperenụ anyị ekpere, nʼihi na o doro anyị anya na anyị nwere akọnuche dị ọcha na-achọkwa ibi ndụ nwere ugwu nʼụzọ niile.
HEB 13:19 Ana m arịọsị unu ya ike, ka unu mee nke a, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ.
HEB 13:20 Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ,
HEB 13:21 mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
HEB 13:22 Ụmụnna m, arịọọ m unu, ka unu were ntachiobi nụrụ okwu agbamume m gwara unu nʼime akwụkwọ a na-etoghị ogologo.
HEB 13:23 Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị Timoti esitela nʼụlọ mkpọrọ pụta. Mụ na ya ga-esoro bịa leta unu ma ọ bụrụ na ọ bịa nʼebe a na mgbe na-adịghị anya.
HEB 13:24 Keleerenụ m ndịisi unu niile na ndị nsọ niile. Ndị si Itali na-ezitere unu ekele ha.
HEB 13:25 Ka amara dịnyere unu niile.
JAM 1:1 Jemis, nwaodibo Chineke na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Na-edegara agbụrụ iri na abụọ ndị gbasara nʼelu ụwa niile akwụkwọ ozi a: Ndeewonụ!
JAM 1:2 Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nʼọṅụ mgbe ọbụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu.
JAM 1:3 Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto.
JAM 1:4 Ka nguzosike unu pụta ìhè, ka unu zuo oke ma nwezuokwa ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke ga-akọ unu.
JAM 1:5 Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya.
JAM 1:6 Ma rịọọ nʼokwukwe na-enweghị obi abụọ, nʼihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya.
JAM 1:7 Onye dị otu ahụ ekwesighị ile anya na ọ ga-esite nʼaka Onyenwe anyị nata ihe ọbụla.
JAM 1:8 Nʼihi na mmadụ dị otu a bụ onye ihu abụọ, onye na-adịghị eguzo nʼotu ebe nʼihe ọbụla ọ na-eme.
JAM 1:9 Ka nwanna ọbụla bụ ogbenye ṅụrịa ọṅụ, mgbe ọbụla e weliri ya elu.
JAM 1:10 Ka onye bụ ọgaranya mgbe a na-eme ka ọ nọdụ ya dị ala, nʼihi na ndị bara ụba ga-akpọnwụ dị ka okoko osisi.
JAM 1:11 Nʼihi na mgbe ọbụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahịhịa kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nʼala, mma ya agwụsịakwa. Nʼotu aka ahụ, onye ahụ bara ụba ga-akpọnwụ ọ bụladị mgbe ọ na-ejegharị nʼime ije ozi ya.
JAM 1:12 Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.
JAM 1:13 Ka onye ọbụla hapụ ị sị, mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke na-anwa m ọnwụnwa a.” Nʼihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ, ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọbụla ka o mee ihe ọjọọ.
JAM 1:14 Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nʼọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya.
JAM 1:15 Ọchịchọ ahụ, mgbe ha bara ụba nʼime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe mmehie bara ụba, ọ na-eduba nʼọnwụ.
JAM 1:16 Ekwela ka onye ọbụla duhie unu ụmụnna m.
JAM 1:17 Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya.
JAM 1:18 Nʼihi imezu nzube ya, o sitere nʼokwu ya bụ eziokwu mụọ anyị. O mekwara nke a ka anyị bụrụ ụmụ mbụ nke ihe o kere eke.
JAM 1:19 Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.
JAM 1:20 Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke.
JAM 1:21 Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu.
JAM 1:22 Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ naanị, na-arafu onwe ha, kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru.
JAM 1:23 Nʼihi na onye ọbụla na-ege ntị nʼokwu ọbụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nʼenyo.
JAM 1:24 O lesịa onwe ya pụọ, o chefuo ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa.
JAM 1:25 Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nʼime iwu ahụ zuruoke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ee, nwoke ahụ na-aga nʼihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka a ga-agọzi nʼihe niile ọ na-eme.
JAM 1:26 Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka maọbụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru.
JAM 1:27 Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.
JAM 2:1 Ụmụnna m, dịka ndị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye dị ebube, ka unu hapụ ile mmadụ anya nʼihu.
JAM 2:2 Ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgbaaka ọlaedo na mkpịsịaka ya, abata nʼụlọ nzukọ unu, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha,
JAM 2:3 ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ yi uwe mara mma anya sị ya, “Bịa nọdụ nʼotu oche a e debere iche nʼihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, guzo nʼebe ahụ,” maọbụ “Bịa nọdụ ala nʼakụkụ ebe a ụkwụ m dị,”
JAM 2:4 ọ bụ na unu akpabeghị oke nʼetiti onwe unu, bụrụkwa ndị ji ile anya nʼihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe?
JAM 2:5 Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya?
JAM 2:6 Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ bụghị ndị ọgaranya na-emegbu unu? Ọ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nʼụlọikpe?
JAM 2:7 Ọ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma ahụ nke a gụrụ unu?
JAM 2:8 Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi.
JAM 2:9 Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu.
JAM 2:10 Nʼihi na onye ọbụla nke na-edebe iwu ahụ niile ma sụọ ngọngọ nʼotu, a bụrụla onye ikpe iwu ahụ niile maara.
JAM 2:11 Nʼihi na onye ahụ sịrị, “Akwala iko,” bụkwa onye sịrị, “Egbula mmadụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu.
JAM 2:12 Ya mere, na-ekwunu okwu, ma na-ebikwanụ ndụ dị ka ndị a ga-ekpe ikpe site nʼiwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ha.
JAM 2:13 Nʼihi na agaghị emere onye ọbụla ebere nke na-adịghị emere onye ọzọ ebere. Nʼihi na ebere na-adị ukwuu karịa ikpe ọmụma ya.
JAM 2:14 Olee uru ọ bara ụmụnna m, na mmadụ sịrị, enwere m okwukwe, ma okwukwe ahụ apụtaghị ihe nʼọrụ ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ pụrụ ịzọpụta ya?
JAM 2:15 Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya nʼụbọchị,
JAM 2:16 ma otu onye nʼime unu asị ha, “Laa nʼudo, kpuchiekwa onwe gị nke ọma, rijuokwa afọ,” nʼenyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara?
JAM 2:17 Nʼụzọ dị otu a, okwukwe naanị ya bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ esoghị ya.
JAM 2:18 Otu onye ga-asị, “I nwere okwukwe; e nwere m ọrụ.” Gosi m okwukwe gị ma e wepụ ọrụ gị, aga m egosi gị okwukwe site nʼọrụ
JAM 2:19 I kweere na ọ bụ naanị otu Chineke, i mere nke ọma, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere ma kụja.
JAM 2:20 Gị onye nzuzu, ị na-achọ ka e gosi gị na okwukwe bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ e soghị ya?
JAM 2:21 Ọ bụ na nna anyị Ebraham abụghị onye a gụrụ nʼonye ezi omume site nʼọrụ ya, mgbe o jiri otu nwa ya bụ Aịzik chụọ aja nʼebe ịchụ aja?
JAM 2:22 Unu ahụghị na okwukwe ya na ọrụ soro rụkọọ nʼotu, e sitekwara nʼọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo oke.
JAM 2:23 Ọ bụ site na nke a ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri mezuo, nke na asị, “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume,” kpọọkwa ya enyi Chineke.
JAM 2:24 Unu ahụla na a na-esite nʼihe mmadụ rụrụ gụọ ya nʼonye ezi omume, ọ bụkwaghị naanị nʼokwukwe.
JAM 2:25 Nʼotu ụzọ ahụ, agụnyeghị Rehab, nwanyị akwụna ahụ nʼonye ezi omume nʼihi ọrụ ọ rụrụ, mgbe ọ kpọbatara ndị nnyopụta ahụ ma zipụkwa ha site nʼụzọ dị iche?
JAM 2:26 Dịka anụ ahụ na-enweghị mmụọ si bụrụ ihe nwụrụ anwụ, otu a ka ọ dịkwa okwukwe na-enweghị ọrụ.
JAM 3:1 Ụmụnna m, ka ọtụtụ nʼime unu hapụ ịgbalị ịbụ ndị ozizi, nʼihi na unu maara na anyị bụ ndị ozizi ka a ga-ekpe ikpe nʼọnọdụ sikarịrị ike.
JAM 3:2 Nʼihi na anyị niile na-asọ ngọngọ site nʼọtụtụ ụzọ. Ma onye ọbụla nke na-adịghị emehie site nʼikwuhie ọnụ bụ onye tozuru oke na onye pụrụ ijide anụ ahụ ya niile aka.
JAM 3:3 Ọ bụrụ na anyị e tinye mkpụmkpụ igwe e ji ekechi ọnụ ịnyịnya ibu nʼọnụ ya, ka o rubere anyị isi, anyị na-eduru ya gaa ebe anyị chọrọ.
JAM 3:4 Otu a kwa, ọ bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nʼosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka ọ gaa ebe ọ chọrọ site nʼịtụgharịa ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ.
JAM 3:5 Otu a ka ọ dịkwa ire anyị. Ọ bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma ọ na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Tulee otu oke ọhịa si dị ukwuu, bụ nke icheku ọkụ dịkarịsịrị nta na-eme ka o nwuru ọkụ.
JAM 3:6 Ire anyị bụ ọkụ. E debere ire nʼetiti akụkụ anụ ahụ ndị ọzọ dịka ụwa ajọ omume. Ọ na-emerụ ahụ niile, na-amụnye ọkụ nʼusoro ndụ mmadụ. Ya onwe ya bụkwa ihe ọkụ ala mmụọ na-amụnye ọkụ.
JAM 3:7 Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na nnụnụ, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri;
JAM 3:8 ma mmadụ ọbụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire. Ọ bụ ihe dị oke njọ na-adịghị ekwe nchịkọta, ma jupụtakwa na nsi na-ebute ọnwụ.
JAM 3:9 Ọ bụ ya ka anyị ji eto Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ya ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nʼoyiyi nke ya.
JAM 3:10 Site nʼotu ọnụ anyị ka ịja mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a abụghị ihe ziri ezi.
JAM 3:11 Ọ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nʼotu isi iyi ahụ na-asọpụta?
JAM 3:12 Ụmụnna m, osisi fiig ọ pụrụ ịmị oliv, ka osisi grepu ọ pụrụ ịmịpụta fiig? Nʼụzọ dị otu a, anyị makwaara na mmiri nnu apụghịkwa ịsọpụta mmiri dị mma ọṅụṅụ.
JAM 3:13 Ọ dị onye ọbụla nʼime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nʼibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nʼobi dị umeala.
JAM 3:14 Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nʼihe ilu na ekworo na ịchọ naanị ihe nke onwe unu, mgbe ahụ, unu ekwesighị ịnya isi sị otu a na-agọnarị eziokwu.
JAM 3:15 Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nʼeluigwe bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa. Ọ bụghị nke mmụọ nsọ. Ọ bụ nke mmụọ ọjọọ.
JAM 3:16 Nʼihi nʼebe ọbụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka ọgbaaghara na omume ọjọọ niile dị.
JAM 3:17 Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme obiọma, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya.
JAM 3:18 Ma ndị ahụ bụ ndị na-eme udo bụ ndị na-agha mkpụrụ udo. Ha ga-aghọta mkpụrụ ezi omume.
JAM 4:1 Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nʼetiti unu. Ebee ka ha siri bịa? Ọ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nʼime onwe unu?
JAM 4:2 Ọ bụrụ na unu chọọ ma unu achọtaghị ya, unu egbuo mmadụ. Unu na-enwe anya ukwu nʼihe onye ọzọ nwere ma ọ bụrụ na unu enwetaghị ya, unu amalite ịlụ ọgụ na ibu agha. Unu enweghị maka unu chọrọ arịọghị ya nʼekpere.
JAM 4:3 Unu na-arịọ ma unu adịghị anata, nʼihi na unu na-arịọ nʼebumnobi ọjọọ. Unu na-arịọ ka unu mefuo ya nʼihe ụtọ nke ụwa.
JAM 4:4 Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.
JAM 4:5 Unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ na-ekwu nʼefu mgbe ọ na-asị, “Chineke na-ekwosi ekworo ike nʼihi Mmụọ Nsọ ya nke o mere ka o biri nʼime anyị.”
JAM 4:6 Ma ọ na-enye anyị amara karịa. Ya mere, Akwụkwọ nsọ ji sị, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”
JAM 4:7 Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ.
JAM 4:8 Bịakwutenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị obi abụọ.
JAM 4:9 Ruonụ ụjụ, tienụ aka nʼobi nʼọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru ụjụ werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ.
JAM 4:10 Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu.
JAM 4:11 Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nʼihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, maọbụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Mgbe unu na-ekpe iwu ahụ ikpe, unu adịghị edebe ya kama unu bụ ndị na-ekpe ya ikpe.
JAM 4:12 Ọ bụ naanị otu onye o nye iwu. Ọ bụkwa naanị otu onye ikpe dị. Ọ bụ naanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọbụla nʼiyi. Ma gị, onye ka ị na-eche na ị bụ iji na-ekpe nwanna gị ikpe?
JAM 4:13 Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa maọbụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, maọbụ obodo dị otu a, ịzụ ahịa na ire ahịa, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.”
JAM 4:14 Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo.
JAM 4:15 Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị ga-adị ndụ, mee nke a maọbụ nke ọzọ.”
JAM 4:16 Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi na ịkpa nganga. Ụdị ịnya isi a bụ ihe ọjọọ.
JAM 4:17 Ya mere, mmadụ ọbụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie.
JAM 5:1 Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge eruola mgbe unu kwesiri ịkwa akwa na ịsụ ude nʼihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu.
JAM 5:2 Akụnụba unu ebidola ịta nchara, mkpu eripịakwala uwe unu.
JAM 5:3 Ọlaọcha na ọlaedo unu agbaala nchara. Nchara a ga-abụkwa ama megide unu, ọ ga-erepịa anụ ahụ unu dịka ọkụ. Unu akpakọtala akụ nʼụbọchị ikpeazụ ndị a.
JAM 5:4 Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesiri na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
JAM 5:5 Unu ebiela ndụ nke oke oriri na oke ọṅụṅụ nʼelu ụwa, na ndụ inye anụ ahụ unu ihe ọbụla na-akpa ya mkpa. Ma ugbu a, anụ ahụ unu ahụ gbara abụba ejikerela na-eche ụbọchị mgburi ya.
JAM 5:6 Unu amala ndị aka ha dị ọcha ikpe, gbukwaa ha, ọ bụladị mgbe ha na-egbochighị unu.
JAM 5:7 Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya.
JAM 5:8 Unu onwe unu kwesikwara inwe ndidi guzosiekwa ike nʼihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.
JAM 5:9 Ụmụnna m, unu atamula ntamu megide ibe unu, ka a hapụ ikpe unu ikpe! Lee, onye ikpe ahụ guzo nʼọnụ ụzọ.
JAM 5:10 Ụmụnna m, dị ka ihe ilere anya banyere inwe ndidi na ahụhụ, mụtanụ ihe site nʼaka ndị amụma bụ ndị kwuru okwu nʼaha Onyenwe anyị.
JAM 5:11 Anyị na-agụ ha ugbu a dịka ndị a gọziri agọzi nʼihi iguzosike ha. Unu anụla maka ogologo ntachiobi nke Job nwere, unu ahụkwala nzube Onyenwe anyị nʼihi na Onyenwe anyị jupụtara nʼebere na ọmịiko.
JAM 5:12 Karịsịa ụmụnna m, unu aṅụla iyi. Unu aṅụkwala iyi mgbe ọbụla, ọ bụladị iji eluigwe maọbụ ụwa, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ṅụọ iyi. Kama ka “E” unu bụrụ “E.” Ka “E e,” unu bụrụkwa “E e.” Ka unu hapụ isite nʼụzọ dị otu a mehie ma wetakwara onwe unu ikpe ọmụma.
JAM 5:13 Ọ dị onye ọbụla nʼetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ otuto.
JAM 5:14 Ọ dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
JAM 5:15 Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, ọ bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya.
JAM 5:16 Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ire.
JAM 5:17 Ịlaịja bụ mmadụ dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị nʼala ahụ ruo afọ atọ na ọnwa isii.
JAM 5:18 Emesịa, o kpekwara ekpere ọzọ, eluigwe nyere mmiri ozuzo, meekwa ka ala pupụta ihe oriri.
JAM 5:19 Ụmụnna m, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼetiti unu esite nʼeziokwu ahụ jehie, ma otu onye nʼime unu akpọghachi ya azụ,
JAM 5:20 chetanụ nke a na onye ọbụla kpọghachitere onye mmehie azụ site na njehie ya, ga-azọpụta ha nʼaka ọnwụ ma kpuchiekwa ọtụtụ mmehie.
1PE 1:1 Pita, onyeozi Jisọs Kraịst, Na-edegara unu ndị niile ndị a họpụtara, ndị gbara ọsọ ndụ gaa biri na Pọntọs, na Galeshịa, na Kapadosia, Eshịa na Bitinia, akwụkwọ a.
1PE 1:2 Unu ndị Chineke bụ Nna họpụtara dị ka o bururị ụzọ mata na ọ ga-eme, jirikwa Mmụọ Nsọ ya doo unu nsọ, ka unu na-erubere Jisọs Kraịst isi, ka ewerekwa ọbara ya sachaa unu: Ka amara na udo baara unu ụba.
1PE 1:3 Otuto dịrị Chineke Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst! Site nʼịba ụba nke ebere ya, o nyela anyị ndụ ọhụrụ baa nʼolileanya dị ndụ site na mbilite nʼọnwụ Jisọs Kraịst.
1PE 1:4 Anyị nwekwara ihe nketa nke na-apụghị imebi emebi, nke na-agaghị ere ure, maọbụ gbanwee ụdịdị ya, nke e debeere anyị nʼeluigwe.
1PE 1:5 Anyị bụ ndị e sitere nʼokwukwe na-echekwa nʼike Chineke, tutu ruo ọbịbịa nzọpụta ahụ, nke a na-ejikere ime ka ọ pụta ìhè nʼọgwụgwụ oge.
1PE 1:6 Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu.
1PE 1:7 Ọnwụnwa ndị a na-abịa ime ka okwukwe unu, nke dị oke ọnụahịa karịa ọlaedo na-ala nʼiyi nʼagbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya; bụrụ nke ga-eweta otuto, na ebube, na nsọpụrụ, mgbe e mere ka Jisọs Kraịst pụta ìhè.
1PE 1:8 Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ ya mgbe ọbụla, ma unu hụrụ ya nʼanya, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kwere na ya. Unu jupụtakwara nʼọṅụ ahụ dị ebube nke ọnụ na-apụghị ịkọwa.
1PE 1:9 Ụgwọ ọrụ ọzọ unu ga-enweta nʼihi okwukwe unu nʼime ya ga-abụ nzọpụta a ga-azọpụta mkpụrụobi unu.
1PE 1:10 Banyere nzọpụta a, ndị amụma ahụ kwuru ihe banyere amara ahụ gaje ịbịara unu jiri nnọọ nwayọọ nyochasịa
1PE 1:11 ma gbalịsie ike ịchọpụta oge na ọnọdụ ahụ bụ nke Mmụọ Kraịst dị nʼime ha kwuru banyere ya, mgbe ọ gbara ama maka ahụhụ Kraịst na ebube nke ga-eso ya.
1PE 1:12 E mere ka ha mata na ọrụ ha na-arụ abụghị maka ọdịmma nke ha onwe ha, kama ọ bụ nʼihi ọdịmma nke unu, mgbe ha kwuru okwu banyere ihe ndị a ahụ bụ ndị a gwarala unu ugbu a site nʼọnụ ndị ziri unu oziọma nʼike Mmụọ Nsọ nke e si nʼeluigwe zite. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi ka ọ gụrụ agụụ ịmata ihe ndị a.
1PE 1:13 Nʼihi ya, werenụ uche unu niile jikere ịrụ ọrụ, anya dokwaa unu. Nweenụ olileanya zuruoke nʼamara nke a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe Jisọs Kraịst.
1PE 1:14 Dị ka ụmụ na-erube isi, unu ekwela ka ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ unu agụụ mgbe unu nọ nʼọchịchịrị, na-achị ndụ unu.
1PE 1:15 Kama bụrụnụ ndị dị nsọ nʼihe niile unu na-eme, dịka onye kpọrọ unu si dị nsọ.
1PE 1:16 Nʼihi na e dere ya ede, “Dịnụ nsọ, nʼihi na adị m nsọ.”
1PE 1:17 Ebe unu na-akpọku Nna ahụ na-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya sịrị dị na-eleghị mmadụ anya nʼihu, bienụ ndụ unu nʼịtụ egwu Chineke, dịka ndị mbịarambịa nʼụwa a.
1PE 1:18 Nʼihi na unu matara na-ejighị ihe pụrụ imebi emebi, dịka ọlaọcha na ọlaedo gbapụta unu site nʼibi ndụ ọjọọ ahụ nna nna unu ha nyefere unu nʼaka
1PE 1:19 kama ọ bụ ọbara dị oke ọnụahịa nke Kraịst bụ nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ọrụsị.
1PE 1:20 A họpụtara ya tupu e kee ụwa. Kama, ọ bụ nʼọgwụgwụ oge ndị a ka e mere ka ọ pụta ìhè nʼihi unu.
1PE 1:21 Ọ bụkwa site nʼaka ya ka unu ji bụrụ ndị kwere na Chineke, onye mere ka o si nʼọnwụ bilie, na onye nyekwara ya ebube. Ya mere, okwukwe unu na olileanya unu dị na Chineke.
1PE 1:22 Ugbu a, ebe unu sitere nʼirubere eziokwu ahụ isi mee ka obi unu dị ọcha, nke mere na unu nwere ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị nʼebe ụmụnna unu nọ, sitenụ nʼobi unu na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nʼebe ọ dị ukwuu.
1PE 1:23 Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, ọ bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa.
1PE 1:24 Nʼihi na, “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,
1PE 1:25 ma okwu Onyenwe anyị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Okwu ahụ bụkwa oziọma ahụ e zisaara unu.
1PE 2:1 Ya mere, wezuganụ nʼibu iro nʼobi na aghụghọ niile unu, kwụsịnụ ịgha ụgha, ịbụ ndị ihu abụọ, ndị na-ekwo ekworo, na ndị na-ekwutọ mmadụ ibe ha.
1PE 2:2 Dịka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, bụrụnụ ndị agụụ ịṅụ mmiri ara nke Mmụọ Nsọ a na-agwaghị ihe ọbụla na-agụ, ka unu nwee ike site na ya na-eto eto nʼime nzọpụta unu.
1PE 2:3 Ugbu a, unu detụrụla ya ire matakwa na Onyenwe anyị dị mma.
1PE 2:4 Bịakwutenụ ya, Nkume ahụ dị ndụ, onye ụmụ mmadụ jụrụ, maọbụ onye Chineke họpụtara, onye dị oke ọnụahịa nye ya.
1PE 2:5 Unu onwe unu kwa dị ka nkume dị ndụ ka a na-ewu ime ka unu ghọọ ụlọ ime mmụọ, ka unu bụrụkwa ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja ime mmụọ nke Chineke na-anabata site na Jisọs Kraịst.
1PE 2:6 Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ kwuru, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke a họpụtara, bụkwa nkume isi ntọala dị oke ọnụahịa. Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
1PE 2:7 Ma nye unu ndị kwere ekwe nkume a dị oke ọnụahịa, ma nʼebe ndị ahụ na-ekweghị ekwe nọ, “Ọ bụ nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.”
1PE 2:8 Ọ bụ kwa, “Nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa.” Ha na-asọ ngọngọ nʼihi na ha jụrụ irube isi nʼokwu ahụ. Nke a bụkwa ihe a kara aka banyere ha.
1PE 2:9 Ma unu bụ ndị a họpụtara, otu ndị nchụaja eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nʼonwe ya, ka unu bụrụ ndị na-ekwusa otuto ya, bụ onye ahụ si nʼọchịchịrị kpọbata unu nʼìhè ya dị ebube.
1PE 2:10 Nʼoge gara aga, unu abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya. Na mbụ, unu amaghị ihe ọbụla banyere obi ebere ya, ma ugbu a, obi ebere ya erutela unu aka.
1PE 2:11 Nʼihi ya, ndị enyi m, ana m arịọ unu, dịka ndị bụ ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ nʼụwa a, nke unu bụ, na-asị unu, wezuganụ onwe unu site nʼagụụ mmehie nke na-ebuso mkpụrụobi unu agha.
1PE 2:12 Bienụ ezi ndụ nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ọ ga-abụ na a sị na ha ebo unu ebubo ime ihe ọjọọ, ha ga-ahụ ọrụ ọma unu, ma nye Chineke otuto nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa.
1PE 2:13 Werenụ onwe unu nyefee, nʼihi Onyenwe anyị, nʼokpuru ọchịchị niile e guzobere nʼetiti ụmụ mmadụ, ma ọchịchị ahụ ọ bụ nke eze, dịka onye ike ya kacha nke ibe ya,
1PE 2:14 maọbụ nke ọchịchị gọvanọ, onye e guzobere nʼihi ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ, na ito ndị na-eme ezi ihe otuto.
1PE 2:15 Nʼihi na ọ bụ uche Chineke na unu ga-esite nʼezi ọrụ unu kpuchie ọnụ ndị ahụ na-esite na-amaghị ihe ha, na-ekwu okwu nzuzu.
1PE 2:16 Na-ebinụ ndụ dị ka ndị nwere onwe ha, ma unu ejikwala mnwere onwe unu mere ihe mkpuchi nke ajọ ihe. Bienụ dịka ụmụodibo Chineke.
1PE 2:17 Sọpụrụnụ mmadụ niile dịka o si kwesi. Gosi ndị niile kwere ekwe ịhụnanya. Tụọ Chineke egwu, ma na-asọpụrụ eze.
1PE 2:18 Ndị ohu, ruberenụ ndị nwe unu isi, na-enyekwa ha nsọpụrụ na ugwu ruuru ha. Unu emela nke a nye naanị ndị bụ ezi mmadụ, na ndị nwere obiọma nʼebe unu nọ, kama meekwanụ ya ọ bụladị nye ndị afọ tara mmiri.
1PE 2:19 Nʼihi na nke a bụ ihe inye ekele ma ọ bụrụ na unu ejiri ntachiobi na-edi ahụhụ na-ezighị ezi na-adakwasị unu, nʼihi na unu na-eme ihe Chineke na-achọ.
1PE 2:20 Ma o nweghị otuto ọbụla dịrị unu mgbe a tara unu ahụhụ nʼihi na unu mejọrọ, unu na-edikwa ya? Ma ọ bụrụ na unu enwee ntachiobi mgbe a na-ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọma unu na-eme, nke a na-ewetara Chineke otuto.
1PE 2:21 Ọ bụ nʼihi ihe dị otu a, ka e jiri kpọọ unu, nʼihi na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼihi unu. Ọ bụkwa ihe ịmaatụ nye unu. Na-esonụ nzọ ụkwụ ya.
1PE 2:22 “O nweghị mgbe ọbụla o mehiere, o nwekwaghị mgbe onye ọbụla nụrụ okwu aghụghọ nʼọnụ ya.”
1PE 2:23 O kwutọghị onye ọbụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọbụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama o were ya nyefee nʼaka onye ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi.
1PE 2:24 Nʼelu obe ahụ, o buuru mmehie anyị niile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị; ma dịrị ndụ nʼebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site nʼapa ọnya dị ya nʼahụ ka o ji gwọọ unu.
1PE 2:25 Na mbụ, unu dị ka ụmụ atụrụ na-awagharị na-achọ ụzọ, ma ugbu a, e meela ka unu laghachikwute Onye ahụ na-azụ unu dị ka atụrụ, na Onye na-elekọtakwa mkpụrụobi unu anya.
1PE 3:1 Unu ndị bụ nwunye na-eruberenụ di unu isi, ka ụfọdụ nʼime ha na-ekweghị nʼokwu Chineke, nwee ike isi nʼezi ndụ unu na-ebi chegharịa nʼekwughị okwu ọbụla,
1PE 3:2 mgbe ha na-ahụ ibi ndụ unu nke dị ọcha na nke inwe nsọpụrụ.
1PE 3:3 Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma.
1PE 3:4 Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke.
1PE 3:5 Nke a bụ ụzọ ndị inyom mgbe ochie, bụ ndị dị nsọ, ndị olileanya ha dị nʼime Chineke siri chọọ onwe ha mma. Ha debekwara onwe ha nʼokpuru di nke aka ha.
1PE 3:6 Dịka Sera rubeere Ebraham isi, na-akpọkwa ya onyenwe m. Unu bụ ụmụ Sera ma ọ bụrụ na unu e mee ihe ziri ezi, na-ekweghị ka egwu tụọ unu.
1PE 3:7 Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.
1PE 3:8 Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala.
1PE 3:9 Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu.
1PE 3:10 Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-achọ ndụ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ndị ahụ dị mma, ya mee ka ire ya ghara ikwu okwu ọjọọ meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ.
1PE 3:11 Ka ha tụgharịa site nʼajọ ihe ma mee ezi ihe; ka ha chọọ udo, ma na-agbasokwa ya.
1PE 3:12 Nʼihi na anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye ekpere ha, ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”
1PE 3:13 Onye ga-emegide unu ma ọ bụrụ na unu na-anụ ọkụ nʼobi ime ezi ihe?
1PE 3:14 Ma a sịkwarị na unu ahụ ahụhụ nʼihi na unu mere ihe ziri ezi, ngọzị dịrị unu. “Unu atụla egwu ihe ha na-atụ egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri.”
1PE 3:15 Na-edonụ Kraịst nsọ nʼime obi unu dịka Onyenwe anyị. Nọọkwanụ na njikere mgbe niile iguzo kọwaara onye ọbụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nʼime unu. Ma unu were obi dị nwayọọ na nsọpụrụ na-eme nke a.
1PE 3:16 Ma na-enwenụ akọnuche dị ọcha, ka ndị ahụ na-ekwulu ibi obi ọma unu nʼime Kraịst, bụrụ ndị ihere ga-eme banyere nkwutọ ha na-ekwutọ unu.
1PE 3:17 Nʼihi na ọ ka mma ịta ahụhụ nʼihi ezi ihe ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụhụ nʼihi ajọ ihe.
1PE 3:18 Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nʼihi unu otu mgbe. Onye ezi omume nwụrụ nʼihi ndị ajọ omume, ka ọ kpọrọ unu bịakwute Chineke. Nʼihi na e mere ka ọ nwụọ nʼanụ ahụ ma e mekwara ka ọ dị ndụ na mmụọ ya.
1PE 3:19 Mgbe emesịrị ka ọ dị ndụ na mmụọ ya, ọ gara kwusaa oziọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nʼụlọ mkpọrọ.
1PE 3:20 Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachiobi chere ha nʼoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ naanị mmadụ asatọ nʼime ndị bi nʼoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ.
1PE 3:21 Mmiri a nọ ọnọdụ dị ka baptizim nke na-azọpụta unu ugbu a. Ọ anaghị asapụ unyi site nʼahụ mmadụ, kama ọ bụ ihe na-egosi ezi akọnuche nʼebe Chineke nọ. Ọ na-azọpụta unu site na mbilite nʼọnwụ nke Jisọs Kraịst,
1PE 3:22 onye nọ nʼeluigwe, nʼaka nri Chineke, ebe ndị mmụọ ozi niile, na ịchị isi niile, na ike niile na-erube isi nye ya.
1PE 4:1 Ya mere, ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼanụ ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe ụdị obi ahụ o nwere. Nʼihi na onye tara ahụhụ nʼanụ ahụ akwụsịla ime mmehie.
1PE 4:2 Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama ọ na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke.
1PE 4:3 Nʼoge gara aga unu tufuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị mba ọzọ ụtọ. Ndụ unu jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ihe ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ikpere arụsị niile, bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ.
1PE 4:4 Ma ndụ unu na-ebi ugbu a na-eju ha anya ebe ọ bụ na unu anaghị esokwa ha ebi ndụ ọjọọ ndị ahụ ọzọ, nʼihi nke a ha na-ekwutọkwa unu.
1PE 4:5 Ma ha ga-eji ọnụ ha kwupụta ihe ha mere nʼihu onye ahụ ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.
1PE 4:6 Ọ bụ nke a mere e ji kwusaa oziọma ọ bụladị nye ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ ndị e kperela ikpe mgbe ha dị ndụ, dịka e si ekpe mmadụ niile ikpe, ka ha site na nke a bie ndụ dị ka Chineke si chọọ site na mmụọ ahụ.
1PE 4:7 Ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuruoke, ndị anya doro, ka unu nwee ike na-ekpekwa ekpere.
1PE 4:8 Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nke ukwuu nʼihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.
1PE 4:9 Jirinụ obiọma na-elerịta ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọbụla.
1PE 4:10 Onye ọbụla nʼime unu dịka ndị ozi natara onyinye amara nke Chineke, jirinụ onyinye ọbụla unu natara na-ejeritara onwe unu ozi.
1PE 4:11 Onye na-ekwu okwu ya kwuo ya dị ka ọ bụ nnọọ okwu Chineke ka ọ na-ekwu. Onye na-eje ozi ya jee ya site nʼike ahụ Chineke na-enye. Nʼime ihe niile ka otuto dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
1PE 4:12 Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche na-abịara unu nʼihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nʼebe unu nọ.
1PE 4:13 Kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na unu so Kraịst na-eketa oke nʼahụhụ ya, ka e sikwa otu a mee ka obi unu jupụta nʼọṅụ, unu ga-etikwa mkpu ọṅụ mgbe a ga-eme ka ebube ya pụta ìhè.
1PE 4:14 Ọ bụrụ na a na-ekwutọ unu nʼihi aha Kraịst, unu bụ ndị a gọziri agọzi. Nke a na-ezipụta na mmụọ nke ebube ahụ bụ mmụọ Chineke na-ebi nʼime unu.
1PE 4:15 Ka onye ọbụla nʼime unu ghara ịta ahụhụ nʼihi na o gburu mmadụ maọbụ dị ka onye ohi, maọbụ dị ka onye na-eme ihe ọjọọ, maọbụ dị ka onye na-anara mmadụ ihe nʼaka ike.
1PE 4:16 Ma ihere ekwesighị ime unu mgbe unu na-ata ahụhụ dị ka ndị Kraịst. Kama nyenụ Chineke otuto na unu bụ ndị a na-akpọ aha ahụ.
1PE 4:17 Nʼihi na oge eruola, mgbe a ga-amalite ikpe nʼezinaụlọ Chineke. Ọ bụrụ na a ga-ebu ụzọ kpee anyị ikpe, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ndị ahụ na-ekwenyeghị nʼoziọma Chineke?
1PE 4:18 Ma, “Ọ bụrụkwa na ọ dị ike ịzọpụta onye ezi omume, oleekwanụ olileanya dịrị onye na-amaghị Chineke na onye mmehie?”
1PE 4:19 Ya mere, ndị na-ata ahụhụ dị ka nzube Chineke si dị, nyefeenụ onwe unu nʼaka onye okike, onye kwesiri ntụkwasị obi, ma nọgidenụ na-eme ezi ihe.
1PE 5:1 Mụ onwe m, onye bụ okenye na onyeama banyere ahụhụ Kraịst, bụrụkwa onye ga-eso keta oke nʼebube ya nke a gaje ikpughe, a na m arịọ ndị okenye nʼetiti unu arịrịọ a,
1PE 5:2 na-azụnụ igwe atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nʼaka. Ka unu na-elekọta ha, ọ bụghị nʼihi na unu agaghị ime otu a, kama ọ bụ ihe sitere nʼọchịchọ obi unu, dị ka Chineke chọrọ ka unu mee. Ọ bụkwaghị nʼihi ego unu ga-enweta, kama ọ bụ ịnụ ọkụ unu nʼije ozi.
1PE 5:3 Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ.
1PE 5:4 Ma mgbe Onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-abịa unu ga-anata okpueze ebube nke na-agaghị agbanwe agbanwe.
1PE 5:5 Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”
1PE 5:6 Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya.
1PE 5:7 Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.
1PE 5:8 Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi.
1PE 5:9 Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile.
1PE 5:10 Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi.
1PE 5:11 Ọ bụ ya nwe ike niile ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
1PE 5:12 Ọ bụ site nʼinyeaka Saịlas onye m hụtara dị ka nwanna kwesiri ntụkwasị obi ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole ndị a nke m ji agbaa unu ume na-ekwupụtakwa na nke a bụ eziokwu dị nʼamara Chineke. Guzosienụ ike nʼime ya.
1PE 5:13 Nwanyị ahụ nọ na Babilọn, nke a họpụtara unu na ya, na-ekele unu. Mak, ezi nwa m nwoke na-ekelekwa unu.
1PE 5:14 Jirinụ isurita ọnụ ịhụnanya kelerịta onwe unu. Ka udo dịnyere unu niile nọ nʼime Kraịst.
2PE 1:1 Ọ bụ Saimọn Pita, odibo na onyeozi nke Jisọs Kraịst, Na-edegara ndị niile anyị na ha ketara otu ụdị okwukwe a dị oke ọnụahịa, nʼime ezi omume nke Chineke na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a:
2PE 1:2 Ka amara na udo bara unu ụba, site na mmazu nke Chineke na nke Jisọs Onyenwe anyị.
2PE 1:3 O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị mkpa ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya.
2PE 1:4 O sitela nʼihe ndị a nye anyị nkwa dị ukwuu na nke dị oke ọnụahịa, ka anyị site na ha keta oke nʼụdịdị nsọ ya, si otu a gbanarị ịrụ arụ dị nʼụwa, nke ọchịchọ ọjọọ na-ebute.
2PE 1:5 Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma,
2PE 1:6 tụkwasịkwanụ imerụ ihe nʼoke nʼelu ihe ọmụma, tụkwasịkwanụ ntachiobi nʼelu imerụ ihe na oke, ma na-atụkwasịkwanụ ibi ndụ dị ka ndị Chineke nʼelu ntachiobi.
2PE 1:7 Tụkwasịkwanụ obiọma nye ụmụnna nʼelu ibi ndụ dị ka ndị Chineke, ma na-atụkwasịkwanụ ịhụnanya nʼelu obiọma nye ụmụnna.
2PE 1:8 Ọ bụrụ na unu enwe ihe ndị a nʼụzọ ha jubigakwara oke nʼime unu, mgbe ahụ ha ga-eme ka unu ndị na-adịghị amị mkpụrụ, bụrụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nʼihe unu maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
2PE 1:9 Ma onye ọbụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nʼokwukwe ya nọ nʼọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na a sachapụla ya mmehie ya, ndị o mere nʼoge gara aga.
2PE 1:10 Nʼihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike iguzosike nʼọkpụkpọ na nhọpụta unu. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsọ ngọngọ maọbụ daa.
2PE 1:11 Nʼụzọ dị otu a, a ga-enye unu ohere dị ukwuu iji bata nʼalaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst.
2PE 1:12 Aga m na-aga nʼihu na-echetara unu ihe ndị a site nʼoge ruo nʼoge. Ọ bụ ezie na unu maara na ha na-eguzosikwa ike nʼeziokwu ahụ unu natara.
2PE 1:13 Ana m agụ ya nʼihe ziri ezi ịkpọte mmụọ unu na uche unu site nʼichetara unu ihe ndị a ugbu a m dị ndụ nʼanụ ahụ a.
2PE 1:14 Nʼihi na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoohaa, na m ga-eyipụ ya nʼoge na-adịghị anya.
2PE 1:15 Aga m agbalịsi ike ịhụ na mgbe m hapụchara ụwa nke a, unu ga na-echeta ihe ndị a mgbe niile.
2PE 1:16 Ihe niile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nʼamamihe ya. Nʼihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbịa ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ebube nke ịbụ eze ya.
2PE 1:17 Nʼihi na ọ natara nsọpụrụ na ebube site nʼaka Chineke bụ Nna mgbe olu ahụ si nʼebube ahụ dị ukwuu daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma.”
2PE 1:18 Anyị onwe anyị nụrụ olu ahụ si nʼeluigwe daa mgbe anyị so ya nọdụ nʼelu ugwu nsọ ahụ.
2PE 1:19 Anyị nwapụtara na okwu ndị amụma ahụ bụ ihe mezuru emezu. Unu onwe unu kwesikwara ilezi anya nʼokwu ndị ahụ, dịka a ga-asị na ha bụ ìhè na-enwu nʼebe ọchịchịrị gbara nke na-adị ruo mgbe chi bọrọ, mgbe e mere ka kpakpando ọtụtụ walie nʼobi unu.
2PE 1:20 Nke ka nke, ghọtanụ na okwu amụma ọbụla dị nʼakwụkwọ nsọ abụghị nke e dere dịka akọnuche mmadụ si dị.
2PE 1:21 Nʼihi na o nweghị okwu amụma ọbụla nke e chepụtara dị ka ọchịchọ obi mmadụ si dị, kama mgbe ndị mmadụ kwuru okwu nʼaha Chineke, ọ bụ Mmụọ Nsọ duru ha.
2PE 2:1 Ma na mgbe ochie ahụ kwa, e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nʼetiti ha, dịka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nʼetiti unu. Ndị a ga-esite na nzuzo na-ewebata ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nʼiyi, ha ga-agọnarị ọ bụladị onye kachasị ihe niile, bụ Onyenwe, onye gbapụtara ha. Ha na-eweta ịla nʼiyi na mberede, na-atụkwasị onwe ha nʼisi.
2PE 2:2 Ya mere, ọtụtụ mmadụ ga-esoro ndụ rụrụ arụ ha na-ebi, nʼihi ha ga-ekwutọkwa ụzọ nke eziokwu ahụ.
2PE 2:3 Nʼanya ukwu ha, ndị nkuzi ụgha ndị a ga-eji okwu nrafu rigbuo unu nʼuru. Site na mgbe ochie, onye ga-ekpe ha ikpe dị njikere. Onye ga-ala ha nʼiyi anaghị arahụ ụra.
2PE 2:4 Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama o weere ha kpọchie nʼime ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ na-eche ụbọchị ikpe ahụ.
2PE 2:5 Ọ bụrụkwa na o mereghị ndị ụwa nke mbụ ebere mgbe o mere ka uju mmiri bịakwasị ndị bi na ya na-amaghị Chineke, kama ọ zọpụtara naanị Noa bụ onye kwusara ezi omume na mmadụ asaa ndị ọzọ.
2PE 2:6 Ọ bụrụ na ọ mara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe site nʼiwere ọkụ rechapụ ha, mee ha ihe ịmaatụ banyere ihe gaje ịbịakwasị ndị na-amaghị Chineke;
2PE 2:7 ọ bụrụkwa na ọ napụtara Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ nke ndị na-emebi iwu wutere
2PE 2:8 (nʼihi na nwoke ezi omume ahụ nke na-ebi nʼetiti ha ụbọchị niile, ehihie na abalị, bụ onye eji ọrụ mmebi iwu niile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, mekpaa mkpụrụobi ezi omume ya ahụ).
2PE 2:9 Ọ bụrụ na ọ dị otu a, Onyenwe anyị maara otu o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site nʼọnwụnwa niile gbara ha gburugburu. Ọ makwaara edebe ndị ajọ omume nʼahụhụ, tutu ruo ụbọchị ikpe ahụ.
2PE 2:10 Nke a bụ eziokwu banyere ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ emerụrụ emerụ nke anụ ahụ mmehie ha, na-eledakwa ike ọchịchị anya. Ndị nwere anya ike ma jupụtakwa na mpako. Ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ.
2PE 2:11 Lee, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi karịrị ha nʼịdị ike, nweekwa ume karịa, ma ha anaghị e kpegide ha ikpe nkwujọ nʼihu Onyenwe anyị.
2PE 2:12 Lee ka ha si na-ekwulu ihe ndị ha aghọtaghị. Ha dị ka ụmụ anụ ọhịa, ndị nzuzu na-eme naanị ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha. Ndị a mụrụ naanị maka ijide ha ma bibiekwa ha. A ga-egbu ha otu e si egbu ụmụ anụ ọhịa ndị a.
2PE 2:13 A ga-eji ntaramahụhụ kwụghachi ha ụgwọ ihe ọjọọ ha mere. Ihe na-atọ ha ụtọ bụ ịkpọ oriri na ọṅụṅụ nʼetiti ehihie. Ha bụ ihe ihere, bụrụkwa ndị na-ewetara unu ntụpọ ma ọ bụrụ na ha na-eso unu na-erikọta oriri.
2PE 2:14 Anya ha jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, mmehie adịghị ejukwa ha afọ. Ha na-arafu ndị okwukwe ha na-esighị ike. Ha bụkwa ndị a maara aha ha nʼihi oke ọchịchọ. Nʼezie ha bụ ụmụ a bụrụ ọnụ.
2PE 2:15 Ha esitela nʼezi ụzọ ahụ jehie, soro omume Belam nwa Beoa, onye hụrụ ụgwọ ọrụ nke ajọ omume nʼanya.
2PE 2:16 Ma a baara ya mba maka ajọ omume ya, mgbe e mere ka ịnyịnya ibu ya jiri olu mmadụ gwa ya okwu; gbochie ọrụ onyeisi na-adịghị mma nke onye amụma ahụ chọrọ ịrụ.
2PE 2:17 Ndị a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị, nke na-adịghị ezo mmiri ọbụla. Ndị a kwadobere ebe kachasị ịgba ọchịchịrị.
2PE 2:18 Ha na-eji okwu efu na-enweghị isi, na agụụ ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ ha, na-arafu ndị sitere nʼetiti ndị na-ebi ndụ ọjọọ na-ekewapụ onwe ha.
2PE 2:19 Ha na-ekwe ha nkwa inwere onwe ha, ma ha onwe ha bụ ohu nye ihe rere ure, nʼihi na mmadụ bụ ohu nye ihe ọbụla na-achị achị nʼime ya.
2PE 2:20 Mgbe ha sitere nʼihe niile emerụrụ emerụ nke ụwa gbapụ, site na mmazu nke Onyenwe anyị, na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, bụrụ ndị atụhịrị na mmehie ọzọ, bụrụkwa ndị e meriri, ha ga-abụ ndị ọnọdụ ha ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ.
2PE 2:21 Ọ gaara akara ha mma ma ọ bụrụ na ha amataghị ụzọ ezi omume, karịa na ha matara ya, mesịa gbakụta iwu ahụ dị nsọ nyere ha azụ.
2PE 2:22 Ilu ndị a bụ eziokwu banyere ha sị, “Nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,” ya na, “Nne ezi a sachara ahụ laghachiri ọzọ ịtụrụ onwe ya nʼapịtị.”
2PE 3:1 Ndị enyi m, nke a bụ akwụkwọ nke abụọ m na-edetara unu. Nʼime ha abụọ, ihe m mere bụ ichetara unu ihe ndị ahụ niile unu maara na itute uche unu banyere echiche zuruoke.
2PE 3:2 Achọrọ m ka unu cheta okwu ndị amụma dị nsọ kwuru mgbe ochie na iwu nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị nyere site na ndị ozi ya.
2PE 3:3 Na mbụ, unu ga-amata nke a, na nʼoge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-apụta, site nʼịkwa emo gbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ
2PE 3:4 na-asị, “O kwere unu nkwa na ọ ga-abịa, gịnị mere na ọ bịabeghị? Kemgbe nna nna anyị ha nwụrụ, ihe niile ka dị otu ha dị na mbụ, site nʼokike ụwa.”
2PE 3:5 Ha kpachaara anya chefuo na site nʼogologo oge gara aga, e sitere nʼokwu ọnụ Chineke kee eluigwe ma meekwa ka ụwa dịrị site na mmiri nke gbara ụwa gburugburu.
2PE 3:6 Ọ bụkwa site na mmiri ndị a ka e ji bibie ma laa nʼiyi ụwa nke dị nʼoge ahụ.
2PE 3:7 Ọ bụkwa otu okwu ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị niile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nʼiyi.
2PE 3:8 Ndị enyi m, unu echefula otu okwu a, nʼanya Chineke, otu ụbọchị dịka puku afọ, puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị.
2PE 3:9 Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị.
2PE 3:10 Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị nʼeluigwe ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya.
2PE 3:11 Ebe ọ bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri ị na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke,
2PE 3:12 dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka ọ bịa ngwangwa. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa.
2PE 3:13 Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ o kwere, nkwa inye anyị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume naanị ga-adị.
2PE 3:14 Bikonu ndị m hụrụ nʼanya, mgbe unu nọ na-ele anya ihe ndị a, jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, ndị na-enweghị ịta ụta na ndị ha na ya dị nʼudo.
2PE 3:15 Chetakwanụ na ntachiobi Onyenwe anyị pụtara nzọpụta, dịka ezi nwanna anyị Pọl jiri amamihe Chineke nyere ya deere unu ihe banyere ya.
2PE 3:16 O na-ede otu ihe ahụ nʼakwụkwọ ozi ya niile, na-ekwu ihe banyere ihe ndị a nʼime ha. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta nke ndị nzuzu na ndị na-amaghị ihe na-akọwa dịka ha si chepụta nʼobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere dịka ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ, si otu a wetara onwe ha ịla nʼiyi.
2PE 3:17 Ya mere, ezi ndị enyi m, ebe unu matara nke a, nọrọnụ na nche ka a ghara isite na njehie ndị na-emebi iwu duhie unu, ime ka unu si nʼọnọdụ unu daa.
2PE 3:18 Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen.
1JO 1:1 Ihe anyị na-edere unu banyere ya bụ ihe ahụ na-adịrị site na mmalite, nke anyị nụrụ, nke anyị jikwa anya anyị hụ, nke anyị lekwasịrị anya, na nke aka anyị metụrụ. Anyị na-ekwu ihe banyere Okwu nke ndụ ahụ.
1JO 1:2 Ndụ ahụ pụtara ihe. Anyị ahụla ya ma gbaakwa ama banyere ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ; nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị.
1JO 1:3 Anyị na-ekwusara unu ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ, ka unu soro anyị nwee nnwekọ. Nʼezie nnwekọ anyị bụ nke anyị na Nna na nke Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na-enwekọ.
1JO 1:4 Anyị na-edere unu ihe ndị a nʼihi ime ka ọṅụ anyị zuo oke.
1JO 1:5 Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nʼaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọbụla adịghịkwa nʼime ya.
1JO 1:6 Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nʼezi nnwekọ ma na-ebi nʼime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime anyị.
1JO 1:7 Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nʼìhè, dị ka ya onwe ya si nọọ nʼìhè, mgbe ahụ anyị na ibe anyị na-enwe ezi nnwekọ. Ọbara Jisọs bụ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie anyị niile.
1JO 1:8 Ma ọ bụrụ na anyị asị na anyị adịghị eme mmehie, anyị na-eduhie onwe anyị, na-ajụkwa ịnabata eziokwu ahụ nʼime anyị.
1JO 1:9 Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile.
1JO 1:10 Ọ bụrụ na anyị asị na anyị emeghị mmehie ọbụla, anyị na-akpọ ya onye na-ekwu okwu ụgha, okwu ya enwekwaghị ọnọdụ nʼime anyị.
1JO 2:1 Ezi ụmụntakịrị m, ana m edere unu ihe ndị a ka unu ghara imehie. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla emehie, anyị nwere onye na-ekwuchite ọnụ anyị nʼihu Nna ahụ. Ọ bụ Jisọs Kraịst, Onye ezi omume ahụ.
1JO 2:2 Ọ bụ onye jiri onwe ya chụọ aja nʼihi ikpuchiri anyị mmehie anyị, ma ọ bụghị naanị nʼihi mmehie anyị, ọ bụkwa nʼihi mmehie ụwa niile.
1JO 2:3 Otu a ka anyị si amata na anyị maara onye ọ bụ, ma ọ bụrụ na anyị erube isi nye iwu ya niile.
1JO 2:4 Onye ahụ na-ekwu sị, “Amaara m ya,” ma ọ dịghị eme ihe o nyere nʼiwu bụ onye okwu ụgha, eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime ya.
1JO 2:5 Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-erube isi nʼokwu ya, nʼezie, ịhụnanya Chineke bụ ihe emere ka o zuo oke nʼime ya. Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị nọ nʼime ya.
1JO 2:6 Onye ọbụla na-ekwu na ya bi nʼime ya kwesiri ibi ndụ dịka ya.
1JO 2:7 Ndị enyi m hụrụ nʼanya, anaghị m edere unu ihe gbasara iwu ọhụrụ, kama ọ bụ otu iwu ochie ahụ, nke na-adị site na mbụ. Iwu ochie a bụ nke e ziri unu ozi banyere ya.
1JO 2:8 Ma otu ọ dị, ana m edere unu iwu ọhụrụ, nke bụ eziokwu nʼime ya na nʼime unu. Nʼihi na ọchịchịrị na-agafe, ezi ìhè ebidola ịchawapụta.
1JO 2:9 Onye ọbụla na-asị na ya nọ nʼìhè ma na-akpọ nwanna ya asị, na-anọ nʼọchịchịrị ruo ugbu a.
1JO 2:10 Onye ọbụla na-ahụ nwanna ya nʼanya na-ebi nʼime ihe ahụ ọ dịkwaghị ìhè dị nʼime onye dị otu a bụ nke ga-eme ya ka ọ sụọ ngọngọ.
1JO 2:11 Ma onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị nọ nʼọchịchịrị, na-ejegharịkwa nʼime ọchịchịrị; ọ maghị ebe ọ na-aga nʼihi na ọchịchịrị ahụ emeela ka o kpuo ìsì.
1JO 2:12 Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m nʼihi na a gbagharala unu mmehie niile site nʼaha ya.
1JO 2:13 Ana m edere unu ndị bụ nna ihe ndị a, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu emeriela ajọ onye ahụ.
1JO 2:14 Ana m edere unu ụmụntakịrị, nʼihi na unu maara nna ahụ. Ana m edere unu ndị nna, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu siri ike, okwu Chineke na-ebikwa nʼime unu, unu emeriekwala ajọ onye ahụ.
1JO 2:15 Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya.
1JO 2:16 Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa.
1JO 2:17 Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
1JO 2:18 Ụmụ m, nke a bụ oge awa nke ikpeazụ. Dịka unu nụrụ na otu onye na-emegide Kraịst na-abịa, ọ bụladị ugbu a, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst abịala. Otu a ka anyị si amata na ọ bụ oge awa nke ikpeazụ.
1JO 2:19 Ha si nʼetiti anyị pụọ, ma ha abụghị ndị nke anyị nʼezie. Nʼihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara aga nʼihu soro anyị nọdụ. Ma ọpụpụ ha pụrụ na-egosi na ọ dịghị onye nʼime ha sonyere anyị.
1JO 2:20 Ma unu nwere otite mmanụ sitere nʼOnye Nsọ ahụ, unu niile matakwara ihe niile.
1JO 2:21 Ya mere, anaghị m edegara unu akwụkwọ a dịka ndị na-amaghị eziokwu kama nʼihi na unu maara ya na nʼihi na ọ dịghị okwu ụgha ọbụla na-esi nʼeziokwu ahụ apụta.
1JO 2:22 Onye bụ onye okwu ụgha? Ọ bụ onye ahụ na-asị na Jisọs abụghị Kraịst ahụ. Onye dị otu a bụ onye na-emegide Kraịst, nʼihi na ọ nabataghị Nna ahụ na Ọkpara ya.
1JO 2:23 Onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ enwekwaghị Nna ahụ; ma onye ọbụla nabatara Ọkpara ahụ nwekwara Nna ahụ.
1JO 2:24 Hụnụ na ihe unu nụrụ site na mmalite na-anọgide nʼime unu. Ọ bụrụ na ihe unu nụrụ na mbido ebiri nʼime unu, unu ga-anọgide nʼime Ọkpara ahụ na nʼime Nna ahụ.
1JO 2:25 Ihe o kwere anyị na nkwa bụ nke a, ndụ ebighị ebi.
1JO 2:26 Ana m edere unu ihe ndị a banyere ndị ahụ na-agbalị iduhie unu.
1JO 2:27 Ma unu onwe unu, otite mmanụ ahụ unu natara nʼaka ya na-anọgide nʼime unu, nʼihi nke a, onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Dịka otite mmanụ ya na-ezi unu ihe banyere ihe niile, bụrụkwa eziokwu, ọ bụghị okwu ụgha. Ya mere, dịka o zikwara unu, na-anọgidenụ nʼime ya.
1JO 2:28 Ugbu a ụmụntakịrị m, nọgidesienụ ike nʼime ya, ka ọ ga-abụ mgbe e mere ka ọ pụta ìhè, anyị ga-abụ ndị obi siri ike, ndị ihere na-agaghị eme, nʼihu ya mgbe ọ bịara.
1JO 2:29 Ọ bụrụ na unu matara na ọ bụ onye ezi omume, unu maara na onye ọbụla nke na-eme ihe ziri ezi bụ onye a mụrụ site na ya.
1JO 3:1 Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya.
1JO 3:2 Ndị hụrụ nʼanya, ugbu a anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị ga-abụ nʼoge dị nʼihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè, a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nʼihi na anyị ga-ahụ ya dịka ọ dị.
1JO 3:3 Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha.
1JO 3:4 Onye ọbụla na-eme mmehie na-emebi iwu. Nʼezie mmehie bụ mmebi iwu.
1JO 3:5 Unu maara na e mere ka ọ pụta ìhè iwepụ mmehie. Ọ dịkwaghị mmehie ọbụla dị nʼime ya.
1JO 3:6 Onye ọbụla na-anọgide nʼime ya adịghị ebi ndụ ime mmehie, onye ọbụla nke na-ebi ndụ mmehie ahụbeghị ya anya mgbe ọbụla, ọ matabekwaghị ya.
1JO 3:7 Ezigbo ụmụ m, unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu, onye ọbụla na-eme ezi ihe bụ onye ezi omume dị ka ya onwe ya bụ onye ezi omume.
1JO 3:8 Onye ọbụla na-eme mmehie bụ nwa ekwensu, nʼihi na ekwensu bụ onye mmehie site na mmalite. Ihe mere Ọkpara Chineke jiri pụta ìhè bụ ka ọ laa ọrụ niile nke ekwensu nʼiyi.
1JO 3:9 Onye a mụrụ site na Chineke adịghị anọgide na-eme mmehie, nʼihi na mkpụrụ Chineke na-anọgide nʼime ya, ha enweghị ike ịnọgide na-eme mmehie, nʼihi na a mụrụ ha site na Chineke.
1JO 3:10 Otu a ka anyị si amata ndị bụ ụmụ Chineke, na ndị bụ ụmụ ekwensu: Onye ọbụla na-adịghị eme ihe ziri ezi abụghị nwa Chineke, otu a ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ ụmụnna ha nʼanya.
1JO 3:11 Nʼihi na nke a bụ ozi ahụ unu nụrụ site na mmalite, ka anyị hụrịta onwe anyị nʼanya.
1JO 3:12 Ka anyị hapụ ịdị ka Ken, onye bụ nke ajọ onye ahụ, na onye gburu nwanne ya. Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ nʼihi na ọrụ ya jọrọ njọ, ma nke nwanne ya ziri ezi.
1JO 3:13 Ka ọ gharakwa iju unu anya ụmụnna m, na ụwa kpọrọ unu asị.
1JO 3:14 Anyị matara na anyị esitela nʼọnwụ baa na ndụ nʼihi na anyị na-ahụ ụmụnna anyị nʼanya. Onye ọbụla na-adịghị ahụ ibe ya nʼanya na-anọgide nʼọnwụ.
1JO 3:15 Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya.
1JO 3:16 Ọ bụ otu a ka anyị sị mata ihe bụ ịhụnanya, na Jisọs tọgbọrọ ndụ ya nʼihi anyị. Anyị kwesikwara ịtọgbọ ndụ anyị nʼihi ụmụnna anyị.
1JO 3:17 Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere akụ nke ụwa, ahụ nwanna ya ka ọ nọ na mkpa ma o nweghị obi ebere nʼebe ọ nọ, olee otu ịhụnanya Chineke si dịrị nʼime ya?
1JO 3:18 Ụmụntakịrị m, ka ịhụnanya anyị ghara ịbụ naanị nʼegbugbere ọnụ maọbụ nke okwu efu, kama ka ọ bụrụ nke sitere nʼeziokwu nakwa nʼomume anyị.
1JO 3:19 Anyị ga-esitekwa na nke a mata na anyị bụ ndị nke eziokwu ahụ ma matakwa otu anyị ga-esi mee ka obi anyị kwenye nʼihu ya.
1JO 3:20 Nʼihi na ọ bụrụ na obi anyị amaa anyị ikpe, Chineke dị ukwuu karịa obi anyị, ọ mazukwara ihe niile.
1JO 3:21 Ndị m hụrụ nʼanya, ọ bụrụ na obi anyị amaghị anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu nʼihu Chineke
1JO 3:22 na-anatakwa ya ihe ọbụla anyị rịọrọ nʼihi na anyị na-erube isi nʼiwu ya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ.
1JO 3:23 Nke a bụkwa iwu ya: ka anyị kwere nʼaha Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ya na ịhụrịta ibe anyị nʼanya dịka o nyere anyị nʼiwu.
1JO 3:24 Ndị niile na-erube isi nye iwu ya na-anọgidesikwa ike nʼime ya, ya onwe ya na-anọgidesikwa ike nʼime ndị ahụ! Otu a ka anyị si mara na ọ na-anọgidesike nʼime anyị: Ọ bụ site na Mmụọ nke o nyere anyị.
1JO 4:1 Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa.
1JO 4:2 Otu a ka unu ga-esi mata Mmụọ nke Chineke: Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs Kraịst abịala nʼanụ ahụ sitere na Chineke.
1JO 4:3 Ma mmụọ ọbụla nke na-adịghị ekwupụta Jisọs esiteghị na Chineke, mmụọ dị otu a bụ nke onye ahụ na-emegide Kraịst nke unu nụrụ na ọ ga-abịa, ma ugbu a ọ bịala nʼụwa.
1JO 4:4 Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na Chineke, unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa.
1JO 4:5 Nʼihi na ndị a si nʼime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ naanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị.
1JO 4:6 Anyị sitere na Chineke, onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na Chineke anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha.
1JO 4:7 Ndị m hụrụ nʼanya, o kwesiri ka anyị hụrịtaa onwe anyị nʼanya, nʼihi na ịhụnanya na-esi nʼebe Chineke nọ abịa. Onye ọbụla nwere ịhụnanya bụ onye amụrụ site na Chineke, ọ makwara Chineke.
1JO 4:8 Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, nʼihi na Chineke bụ ịhụnanya.
1JO 4:9 E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya.
1JO 4:10 Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.
1JO 4:11 Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya.
1JO 4:12 O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị.
1JO 4:13 O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nʼime anyị igosi anyị na o bi nʼime anyị, na anyị bikwa nʼime ya.
1JO 4:14 Ma anyị onwe anyị ahụla ma na-agbakwa ama na Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta nke ụwa.
1JO 4:15 Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke.
1JO 4:16 Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.
1JO 4:17 Nʼụzọ dị otu a, a na-eme ka ịhụnanya zuo oke nʼetiti anyị, ka anyị nwee ike inwe nkwuwa okwu nʼụbọchị ikpe ahụ, nʼihi na dịka ya onwe ya dị, otu a ka anyị onwe anyị dịkwa nʼụwa nke a.
1JO 4:18 Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya.
1JO 4:19 Anyị hụrụ ya nʼanya nʼihi na o buru ụzọ hụ anyị nʼanya.
1JO 4:20 Onye ọbụla na-asị, “Ahụrụ m Chineke nʼanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ onye ụgha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nʼanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ pụghị ịhụ Chineke nʼanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya.
1JO 4:21 Iwu o nyere anyị bụ, “Onye ọbụla hụrụ Chineke nʼanya aghakwaghị ịhụ nwanna ya nʼanya.”
1JO 5:1 Onye ọbụla kweere na Jisọs bụ Kraịst bụ onye amụrụ site na Chineke. Onye ọbụla nke hụkwara Nna nʼanya na-ahụkwa Ọkpara ya nʼanya.
1JO 5:2 Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile.
1JO 5:3 Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ.
1JO 5:4 Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị.
1JO 5:5 Onye pụrụ imeri ụwa, ma ọ bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?
1JO 5:6 Ọ bụ onye ahụ bịara site na mmiri na ọbara, ya bụ Jisọs Kraịst. O siteghị naanị na mmiri bịa, kama o sitere na mmiri na ọbara. Ọ bụkwa Mmụọ Nsọ na-agba ama maka ya, nʼihi na Mmụọ Nsọ bụ eziokwu.
1JO 5:7 Nʼihi na ha dị atọ gbara akaebe:
1JO 5:8 Mmụọ Nsọ, na mmiri na ọbara, ha atọ kwekọrịtara.
1JO 5:9 Ọ bụrụ na anyị nabata akaebe nke mmadụ gbara, akaebe nke Chineke gbara dị ukwuu karịa, nʼihi na ọ bụ akaebe Chineke gbara banyere Ọkpara ya.
1JO 5:10 Onye ọbụla kweere nʼỌkpara Chineke nwere ọgbụgba ama a nʼobi ya. Ma onye ọbụla na-ekwereghị na Chineke emeela ya ka ọ bụrụ onye ụgha, nʼihi na o kwereghị nʼama ahụ Chineke gbara banyere Ọkpara ya.
1JO 5:11 Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya.
1JO 5:12 Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ.
1JO 5:13 Ana m edere unu ihe ndị a unu ndị kweere nʼaha Ọkpara Chineke, ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi.
1JO 5:14 Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, ọ na-anụ olu anyị.
1JO 5:15 Ọ bụrụkwanụ na anyị matara na ọ na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya.
1JO 5:16 Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ka nwanna ya na-eme mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ, ya kpee ekpere, Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ. Nke a bụ maka ndị ahụ mmehie ha na-abụghị nke na-eduba nʼọnwụ. E nwere mmehie na-eduba nʼọnwụ. Asịghị m unu kpee ekpere maka nke ahụ.
1JO 5:17 Ajọ omume niile bụ mmehie, ma ọ dị mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ.
1JO 5:18 Anyị matara na onye ọbụla amụrụ site na Chineke anaghị aga nʼihu na-eme mmehie, kama onye ahụ nke amụrụ site na Chineke na-echekwa ha, ajọ onye ahụ adịghị emetụkwa ha aka.
1JO 5:19 Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, ụwa niile nọkwa nʼokpuru ike ajọ onye ahụ.
1JO 5:20 Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, ọ bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi.
1JO 5:21 Ụmụ m, wezuganụ onwe unu site nʼarụsị niile.
2JO 1:1 Ọ bụ okenye ahụ, Na-edegara nwanyị ahụ onye Chineke họpụtara, na ụmụ ya akwụkwọ a, bụ ndị m hụrụ nʼanya nʼime eziokwu. Ọ bụghị naanị m kama ndị niile maara eziokwu ahụ.
2JO 1:2 Nʼihi eziokwu ahụ nke dị nʼime anyị, nke ga-adịgidekwa nʼime anyị ruo mgbe ebighị ebi:
2JO 1:3 Amara, na ebere, na udo nke sitere na Chineke Nna na Jisọs Kraịst, bụ Ọkpara Nna ahụ dịnyere anyị nʼeziokwu nʼịhụnanya.
2JO 1:4 Apụghị m ịkọ ụdị aṅụrị m nwere mgbe m hụrụ na ụfọdụ ụmụ gị na-ebi ndụ ịgbaso eziokwu dịka ihe Nna nyere anyị nʼiwu.
2JO 1:5 Ma ugbu a, ezi nwanyị, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-edere gị kama nke ahụ e nyere anyị site na mmalite. Ana m arịọ ka anyị hụrịta ibe anyị nʼanya.
2JO 1:6 Nke a bụ ịhụnanya ahụ: ka anyị na-ejegharị nʼirube isi nʼiwu ya niile. Dịka unu si nụ ya site na mmalite, unu ahapụkwala ijegharị nʼime ya.
2JO 1:7 Nʼihi na ọtụtụ ndị nduhie apụọla baa nʼụwa, bụ ndị na-adịghị ekwenye na Jisọs Kraịst bịara nʼoyiyi mmadụ. Onye ọbụla dị otu a bụ onye nduhie bụrụkwa onye na-emegide Kraịst.
2JO 1:8 Lezienụ anya, ka unu ghara itufu ụgwọ ọrụ nke anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ maka ya, kama ka unu nata ụgwọ ọrụ unu nʼuju.
2JO 1:9 Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼozizi Kraịst, nke na-esite na ya na ewezuga onwe ya, enweghị Chineke. Ma onye ọbụla na-anọgide nʼozizi ahụ nwere Nna na Ọkpara ya.
2JO 1:10 Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa izi unu ihe ọzọ dị iche site nʼozizi a, unu akpọbatala ya nʼụlọ unu, maọbụ nabatakwa ya.
2JO 1:11 Nʼihi na onye nabatara ya ga-eso onye dị otu a keta oke nʼajọ omume ya.
2JO 1:12 Ọ bụ ezie na enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere unu, ma achọghị m iji akwụkwọ na inki dee ha. Kama, ana m ele anya ịbịa leta unu ka mụ na unu kwukọrịta okwu ihu nʼihu, ka e sikwa otu a mee ka ọṅụ anyị zuo oke.
2JO 1:13 Ụmụ nwanne gị nwanyị, bụ onye a họpụtara, na-ekele unu.
3JO 1:1 Ọ bụ okenye ahụ, Na-edegara Gaiọs, onye ahụrụ nʼanya akwụkwọ a, bụ onye m hụrụ nʼanya nʼeziokwu.
3JO 1:2 Onye m hụrụ nʼanya, ekpere m bụ na ahụ ga-esi gị ike, ka ihe na-agara gị nke ọma, dịka ọ na-agara mkpụrụobi gị nke ọma.
3JO 1:3 Aṅụrịrị m ọṅụ nke ukwu, mgbe ụfọdụ ụmụnna bịara gbaa ama banyere ikwesi ntụkwasị obi gị nye eziokwu, na otu i si nọgide na-agbaso eziokwu ahụ.
3JO 1:4 O nweghị ihe na-enye m ọṅụ karịa ịnụ na ụmụ m na-agbaso eziokwu.
3JO 1:5 Onye m hụrụ nʼanya, i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe ọbụla nke ị na-emere ụmụnna, ọ bụ ezie na ha bụ ọbịa nye gị.
3JO 1:6 Ha akọọlara nzukọ banyere ịhụnanya gị. Biko, mgbe ha na-apụ, nyekwara ha aka nʼije ha nʼụzọ ga-enye Chineke otuto.
3JO 1:7 Ọ bụ nʼihi aha ahụ ka ha biliri ije, na-anaraghị enyemaka ọbụla site nʼaka ndị na-ekweghị ekwe.
3JO 1:8 Nke a mere o ji kwesi ekwesi na anyị ga-elekọta ndị dị otu a anya ka anyị bụrụ ndị so ha na-ejikọta aka nʼotu nʼọrụ eziokwu ahụ.
3JO 1:9 Edere m akwụkwọ ozi zigara nzukọ ahụ, ma Diotrefis onye ọ na-atọ ụtọ ịbụ onye mbụ, anabataghị anyị nke ọma.
3JO 1:10 Ya mere, ọ bụrụ na m abịa, aga m eme ka ihe niile ọ na-eme na ọtụtụ ihe niile ọ na-ekwu megide anyị pụta ìhè. Ọ bụghị naanị na afọ ejughi ya nʼihi ihe ndị a niile, ọ jụrụ ịnabata ndị ụmụnna, ma na-egbochi ndị ọzọ chọrọ ịnabata ha ka ha ghara ime otu ahụ. Ọ na-achụpụkwa ha site nʼụlọ nzukọ.
3JO 1:11 Onye m hụrụ nʼanya, eṅomila ihe dị njọ kama ṅomie ihe dị mma. Onye ọbụla na-eme ezi ihe na-egosi na o si na Chineke. Onye ọ bụlakwa na-eme ajọ ihe ahụbeghị Chineke anya.
3JO 1:12 Onye ọbụla na-agba ezi ama banyere Dimitriọs ọ bụladị eziokwu ahụ nʼonwe ya. Anyị na-ekwukwa ezi ihe banyere ya. Ị makwaara na ọ bụ ezi ama ka anyị na-agba.
3JO 1:13 Enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere gị nʼakwụkwọ, ma achọghị m iji mkpisi odee na inki dee ha.
3JO 1:14 Ọ bụ olileanya m ịbịa ịhụ gị nʼoge na-adịghị anya. Mgbe ahụ anyị ga-anọdụ ala kwuo ihe niile nʼihu nʼihu.
3JO 1:15 Ka udo dịrị gị. Ndị enyi niile nọ nʼebe a na-ekele gị. Kelekwa ndị enyi niile nọ nʼebe ahụ nʼaha nʼaha.
JUD 1:1 Jud, odibo Jisọs Kraịst, na nwanne Jemis, Na-edegara ndị niile a kpọrọ, ndị ahụrụ nʼanya nʼime Chineke, bụ Nna, na ndị nọkwa nʼokpuru nchebe Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a:
JUD 1:2 Ka ebere na udo na ịhụnanya bara unu ụba.
JUD 1:3 Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ na-anụ m ọkụ nʼobi idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nʼotu, ma ahụrụ m mkpa ọ dị idere unu akwụkwọ a, ịrịọ unu ka unu guzosie ike buo agha ichebe okwukwe ahụ, nke e nyefere ndị nsọ nʼaka idebe.
JUD 1:4 Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe.
JUD 1:5 Ọ bụ ezie na unu maa ihe ndị a niile, ma achọrọ m ichetara unu otu Onyenwe anyị si zọpụta ndị ya site nʼala Ijipt, ma mesịa laa ndị niile na-ekweghị ekwe nʼiyi.
JUD 1:6 Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu.
JUD 1:7 Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi.
JUD 1:8 Nʼụzọ dị otu a kwa, ndị a na-emerụ anụ ahụ ha nʼirọ nrọ ha, na-ajụkwa ike ọchịchị niile, ma na-ekwulukwa ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ.
JUD 1:9 Ma Maikel onyeisi ndị mmụọ ozi, mgbe o guzogidere ekwensu na-arụrịtakwa ụka banyere ozu Mosis, ya onwe ya enweghị anya ike ịma ya ikpe nʼihi okwu nkwulu, kama ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị baara gị mba.”
JUD 1:10 Ma ndị a na-ekwulu ihe niile ọbụla ha na-aghọtaghị. Dịka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọbụla dị ha mma nʼanya si otu a na-ala onwe ha nʼiyi.
JUD 1:11 Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha soro nzọ ụkwụ Ken, nyefee onwe ha na ndahie Belam nʼihi ihe nrite nʼuru, ma laa nʼiyi na nnupu isi Kora.
JUD 1:12 Ndị a bụ ihe ntụpọ nʼetiti unu nʼoge mmemme oriri ịhụnanya unu, ha na-eso unu na-erikọ nri na-atụghị egwu ọbụla. Ha bụ ndị na-elekọta naanị onwe ha. Ha dị ka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri, nke ifufe na-ebugharị. Ha bụ osisi a na-ahụ nʼoge ọkọchị nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke e si na mgbọrọgwụ ya hoputa, nke nwụrụ anwụ ugboro abụọ.
JUD 1:13 Ha bụ ebili mmiri na-amagharị nʼosimiri, nke na-asọpụta ihere ha dịka ụfụfụ, kpakpando na-awagharị awagharị, bụ ndị nke a kwadooro ebe kachasị ịgba ọchịchịrị ruo ebighị ebi.
JUD 1:14 Ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka Enọk, onye bụ agbụrụ nke asaa site nʼAdam buru nʼamụma banyere ha sị, “Lee! Onyenwe anyị na-abịa, ya na puku kwụrụ puku ndị nsọ ya.
JUD 1:15 Ọ na-abịa ikpe mmadụ niile ikpe, na ịtụ ha niile mmehie ajọ omume niile ha nʼanya, bụ nke ha mere nʼụzọ na-ezighị ezi. Tinyere okwu ọjọọ niile nke ndị mmehie ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.”
JUD 1:16 Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu oge niile, ndị o nweghị ihe ọbụla na-adị ha mma. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. Ha na-anya isi banyere onwe ha, na-aja ndị ọzọ mma; ka ha nwee ike nweta ihe ha na-achọ nʼaka ha.
JUD 1:17 Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, chetanụ ihe ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kwuru na ha ga-emezu.
JUD 1:18 Nʼihi na ha sịrị unu, “Nʼọgwụgwụ oge ahụ, ndị na-eji ihe niile na-emere ihe ọchị ga-adị. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ.
JUD 1:19 Ọ bụ ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị na-enweghị Mmụọ Nsọ nʼime ha, bụ ndị na-eweta nkewa nʼetiti unu.”
JUD 1:20 Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, nọgidenụ na-ewuli onwe unu elu na ntọala okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ. Na-ekpekwanụ ekpere nʼime Mmụọ Nsọ.
JUD 1:21 Doonụ onwe unu nʼokpuru ịhụnanya Chineke, dịka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-eduba na ndụ ebighị ebi.
JUD 1:22 Gosinụ ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ebere.
JUD 1:23 Zọpụtanụ ndị ọzọ site nʼịgụpụta ha nʼọkụ. Nʼebe ndị ọzọ nọ gosinụ ha obi ebere, kama jirinụ ịtụ egwu mee nke a, kpọọnụ ọ bụladị uwe nke anụ ahụ mmehie merụrụ asị.
JUD 1:24 Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ ichebe unu, ka unu ghara ịda, onye pụrụ ịkpọbata unu nʼihu ya dị ebube nʼọnọdụ enweghị ntụpọ ọbụla nʼoke ọṅụ
JUD 1:25 ka otuto, na ịdị ukwuu, na ike, na ikike ọchịchị; dịrị Onye naanị ya bụ Chineke, Onye nzọpụta anyị, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, tupu nʼọgbọ niile ebido, ka ọ dịrị ya ugbu a, na mgbe niile ebighị ebi. Amen.
REV 1:1 Mkpughe banyere Jisọs Kraịst, nke Chineke nyere ya igosi ndị ohu ya, ime ka ha mata ihe ndị ahụ na-aga ime nʼoge na-adịghị anya. O mere ka amata nke a site na izite mmụọ ozi ya ka ọ bịakwute ohu ya Jọn,
REV 1:2 onye a gbara ama banyere ihe niile ọ hụrụ, okwu Chineke, na ọgbụgba ama Jisọs Kraịst.
REV 1:3 Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-agụpụta okwu ndị a dị nʼamụma a. Ngọzị na-adịkwara ndị na-anụ ya, ma nabata ihe e dere nʼime ya nʼobi ha. Nʼihi na oge mmezu ha dị nso.
REV 1:4 Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a, Na-edere ya nzukọ asaa dị na mpaghara Eshịa: Ka amara na udo nke sitere na Onye ahụ na-adị, Onye ahụ dịkwaarị, na Onye ahụ na-aga ịbịa dịrị unu, sitekwa nʼebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nʼihu ocheeze ya,
REV 1:5 sitekwa nʼaka Jisọs Kraịst, onye bụ onyeama kwesiri ntụkwasị obi, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilie, nakwa onye na-achị ndị eze niile nke ụwa. Nye onye ahụ hụrụ anyị nʼanya ma meekwa ka anyị site nʼọbara ya nwere onwe anyị pụọ na mmehie.
REV 1:6 O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
REV 1:7 “Lee, ọ na-abịa ya na igwe ojii. Anya niile ga-ahụkwa ya, ọ bụladị ndị ahụ niile mapuru ya ahụ, ha ga-ahụ ya.” Mmadụ niile nọ nʼụwa “ga-erukwa ụjụ nʼihi ya.”
REV 1:8 Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, “Abụ m Alfa na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile.”
REV 1:9 Mụ onwe m, Jọn, nwanne unu nwoke, onye unu na ya na-enwekọ ahụhụ na nʼalaeze, na ntachiobi nke bụ oke anyị nʼime Jisọs. Anọ m nʼogbe ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu a na-akpọ Patmọs nʼihi okwu Chineke na-agba ama banyere Kraịst.
REV 1:10 Nʼụbọchị Onyenwe anyị, anọ m nʼime Mmụọ ma nụ otu oke olu dara ụda dị ka opi ike nʼazụ m,
REV 1:11 na-ekwu, “Dee ihe ị na-ahụ ugbu a nʼakwụkwọ zigara ya nzukọ asaa dị nʼEfesọs na Smyrna na Pegamọm na Tiatira na Sardis, na Filadelfia na Laodisia.”
REV 1:12 Mgbe m chigharịrị, lee anya ịhụ onye na-agwa m okwu, ahụrụ m ihe ịdọba oriọna asaa e ji ọlaedo kpụọ.
REV 1:13 Nʼetiti ihe ịdọba oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri nwa nke mmadụ, ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere ihe okike na-acha ọlaedo e ji kee gburugburu obi ya.
REV 1:14 Isi ya na agịrị isi ya na-acha vaa dịka ogho ọcha, dịka akụmmiri igwe. Anya ya abụọ yiri ire ọkụ na-enwusi ike.
REV 1:15 Ụkwụ ya abụọ dị ka bronz a nụchasịrị nnọọ nke ọma hichapụkwa ya. Olu okwu ya na-ada dị ka ụzụ mmiri na-achị achị.
REV 1:16 O jidere kpakpando asaa nʼaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nʼọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dịka anyanwụ na-acha nʼike ya niile.
REV 1:17 Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala nʼụkwụ ya dịka onye nwụrụ anwụ. Ma o weere aka nri ya metụ m nʼahụ na-ekwu sị, “Atụla egwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ.
REV 1:18 Abụ m onye ahụ na-adị ndụ. Anwụrụ m anwụ, ma lee, ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ọ bụkwa m ji ọtụghe igodo nke ọnwụ na nke ọkụ ala mmụọ.
REV 1:19 “Ya mere, detuo ihe niile ị hụrụla, ihe dị ugbu a na ihe gaje ime na mgbe na adịghị anya.
REV 1:20 Nke a bụ ihe omimi nke kpakpando asaa ahụ ị hụrụ nʼaka nri m, na ihe ịdọba oriọna asaa ndị ahụ pụtara. Kpakpando asaa ahụ bụ ndị mmụọ ozi ụlọ nzukọ asaa ahụ. Osisi oriọna asaa ahụ bụ ụlọ nzukọ ndị ahụ nʼonwe ha.
REV 2:1 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị nʼEfesọs, sị ya: Ihe ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ na-ejide kpakpando asaa nʼaka ya, ma na-ejegharịkwa nʼetiti ihe ịdọba oriọna ọlaedo asaa ndị ahụ.
REV 2:2 Amaara m ihe niile banyere ọrụ gị niile. Ahụkwala m ịrụsị ọrụ ike gị na ntachiobi gị. Amaara m na ị dịghị anagide ndị ajọ omume, na ị nwaleela ndị ahụ niile na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị ndị ozi nʼezie, chọpụtakwa na ha bụ ndị ụgha.
REV 2:3 I jirila ntachiobi nagide nhụju anya nʼihi aha m, ma ike agwụghị gị.
REV 2:4 Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị hapụla ịhụnanya mbụ ahụ i nwere.
REV 2:5 Cheta ọnọdụ i si na ya daa. Chegharịa, mekwa ihe ndị ahụ ị na-eme na mbụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m abịa wepụ ihe ịdọba oriọna gị site nʼọnọdụ ya.
REV 2:6 Ọ bụladị otu a, o nwere ihe ụfọdụ dị mma banyere gị. Ị kpọrọ ọrụ ọjọọ nke ndị Nikolaitan asị, dịka mụ onwe m si kpọọ ya asị.
REV 2:7 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye ike iri mkpụrụ sitere nʼosisi ndụ ahụ nke dị na paradaịs nke Chineke.
REV 2:8 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Smyrna, sị ya: Ihe ndị a bụ okwu ahụ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe niile. Onye nwụrụ anwụ ma dịkwa ndụ ọzọ.
REV 2:9 Amaara m mkpagbu gị niile na ịda ogbenye gị. Ma nʼezie, ị bụ ọgaranya. Amaara m ihe banyere nkwutọ niile ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị Juu na-ekwutọ gị, ma ha abụghị ndị Juu, nʼezie ha bụ ụlọ nzukọ ekwensu.
REV 2:10 Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, ọ bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ.
REV 2:11 Onye ọbụla nwere ntị ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Onye ọbụla na-emeri emeri, ọnwụ nke ugboro abụọ agaghị emekpa ya ahụ.
REV 2:12 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị Pegamọm, sị ya: Ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ ji mma agha ahụ dị nkọ nke nwere ihu abụọ nʼaka ya.
REV 2:13 Amaara m ebe i bi, bụ obodo ebe ekwensu nwere ocheeze ya. Ma ị na-anọgidesi ike nʼaha m. Ị jụrụ ịgọnarị okwukwe gị nʼime m, ọ bụladị nʼoge Antipas onyeama m kwesiri ntụkwasị obi, bụ onye e gburu nʼobodo unu, ebe ekwensu bi.
REV 2:14 Ma enwere m ihe ole ma ole megide gị. I nwere ụfọdụ mmadụ ebe ahụ, ndị jidesiri nkuzi Belam ike, bụ onye kuziiri Balak ka o raa ụmụ Izrel ụra nke mere ka ha mehie, rie ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị, kwaakwa iko.
REV 2:15 Nʼotu aka ahụ, i nwekwara ụfọdụ mmadụ ndị jidesiri nkuzi Nikolaitan ike.
REV 2:16 Ya mere, chegharịa! Ma ọ bụghị otu a, aga m abịakwute gị ọsịịsọ jiri mma agha dị m nʼọnụ buso ha agha.
REV 2:17 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Ọ bụ naanị onye na-emeri emeri ka m ga-enye ụfọdụ nʼime achịcha mánà ahụ e zoro ezo. Aga m enyekwa onye ahụ ezi nkume ọcha ahụ, nke edekwasịrị aha ọhụrụ nʼelu ya, nke onye ọbụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ natara ya.
REV 2:18 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Tiatira, sị ya: Ndị a bụ okwu sitere nʼaka Ọkpara Chineke, onye anya ya na-enwuba nʼebe niile dị ka ire ọkụ. Ụkwụ ya kwa na-egbu maramara dị ka bronz a nụchara nke ọma.
REV 2:19 Amaara m ọrụ gị niile, na ịhụnanya gị, na okwukwe gị. Amakwaara m ije ozi gị na ntachiobi gị, na-ahụkwa na ị na-arụ ọrụ ugbu a karịa ka i mere na mbụ.
REV 2:20 Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezebel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyịnye ya ohere ka o were nkuzi asị na-eduhie ndị ohu m ụzọ, ka ha kwaa iko, riekwa ihe e ji chụọrọ arụsị aja.
REV 2:21 Enyela m ya ohere ka o si na mmehie ya chegharịa, ma ọ jụrụ ichegharị site na ndụ ịkwa iko.
REV 2:22 Lee, aga m etinye ya nʼute ahụhụ, meekwa ka ndị ya na ha na-akwa iko taa ahụhụ dị ukwuu. Ọ bụ naanị ma ha chegharịrị ka ihe ndị a na-agaghị abịakwasị ha.
REV 2:23 Ma nʼebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ niile ga-amata na abụ m onye na-enyocha mmụọ na mkpụrụobi niile. Aga m akwụghachikwa onye ọbụla nʼime unu ụgwọ ọrụ kwesiri ọrụ ya.
REV 2:24 Ugbu a, ana m agwa unu ndị fọdụrụ na Tiatira, unu ndị na-agbasoghị ozizi ya, ndị na-amụtabekwaghị ihe ndị ahụ ekwensu kpọrọ ihe nzuzo dị omimi,‘O nweghị ibu arọ ọzọ m ga-ebokwasị unu,
REV 2:25 ma ọ bụghị, unu jidesienụ ihe unu nwere aka ike tutu ruo mgbe m ga-abịa.’
REV 2:26 Ma onye ọbụla na-emeri emeri, na-anọgidekwa na-eme uche m ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka m ga-enye ikike nʼebe mba niile nọ.
REV 2:27 Onye ahụ, ‘ga-eji mkpara igwe chịa ha, dịka mgbe a kụwachara ite aja na mpekele na mpekele.’Ọ bụladị ka Nna m si nye m ike,
REV 2:28 a ga-enye onye nke meririnụ kpakpando ụtụtụ.
REV 2:29 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.
REV 3:1 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Sardis, sị ya: Ndị a bụ okwu onye ahụ nwere mmụọ asaa nke Chineke na kpakpando asaa. Amaara m ọrụ gị niile, ị nwere aha dịka onye dị ndụ ma ị bụ onye nwụrụ anwụ.
REV 3:2 Ugbu a, sị nʼụra bilite. Mee ka ihe ntakịrị ahụ fọdụrụ na-achọ ịnwụ anwụ dịrị ike. Nʼihi na ọ dịghị ọrụ gị m hụrụ dị ka ihe zuruoke nʼanya Chineke m.
REV 3:3 Ya mere, cheta ihe ndị ahụ ị natara na nke ị nụrụ; rube isi nye ya, chegharịakwa. Ma ọ bụrụ na i tetaghị, aga m abịakwute gị dị ka onye ohi, ị gaghị amatakwa oge m ji bịakwute gị.
REV 3:4 Otu ọ dị, i nwere ụfọdụ mmadụ na Sardis ndị na-emerụbeghị uwe ha. Ha ga-eyiri uwe ọcha ma soro m jee ije nʼihi na ha bụ ndị kwesiri ekwesi.
REV 3:5 Onye ọbụla na-emeri emeri, ka a ga-eyikwasị uwe mwụda ọcha dịka ha. Agaghị m ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, kama aga m ekwupụtakwa aha ahụ nʼihu Nna m na nʼihu ndị mmụọ ozi niile.
REV 3:6 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ nsọ na-agwa nzukọ niile.
REV 3:7 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Filadelfia, sị ya: Ndị a bụ okwu onye dị nsọ na onye eziokwu, onye ahụ ji ọtụghe igodo Devid, nke o ji emeghepụ ihe onye ọbụla na-apụghị imechi, na nke o ji emechi ihe onye ọbụla na-apụghị imeghe.
REV 3:8 Amaara m ọrụ gị niile. Lee, edebela m nʼihu gị ọnụ ụzọ nke e meghere emeghe, nke onye ọbụla na-apụghị imechi. Amaara m na i nwere ike dị ntakịrị, ma i debere okwu m, ị gọnarịkwaghị aha m.
REV 3:9 Aga m eme ka ndị ahụ so na nzukọ ekwensu, bụ ndị na-asị na ha bụ ndị Juu ma ha abụghị, kama ha bụ ndị ụgha, aga m eme ka ha bịa kpọọ isiala nye gị, si otu a ghọta na ahụrụ m gị nʼanya.
REV 3:10 Ebe i sitere na ntachiobi sọpụrụ okwu m niile, aga m ekpuchi gị site nʼoke mkpagbu ahụ, nke ga-abịakwasị ụwa mgbe a ga-anwale ndị niile bi nʼime ya.
REV 3:11 Ana m abịa ọsịịsọ. Jidesienụ ihe unu nwere aka ike, ka onye ọbụla ghara ịnapụ gị okpueze gị.
REV 3:12 Ma onye ọbụla na-emeri emeri, ka m ga-eme ka ọ bụrụ ogidi nʼime ụlọnsọ Chineke m. Ọ gaghị esikwa nʼebe ahụ pụọ apụọ. Aga m edekwasịkwa aha Chineke m nʼahụ, na aha obodo nsọ Chineke, nke bụ Jerusalem ọhụrụ ahụ si nʼeluigwe, ebe Chineke nọ na-arịdata. Aha ọhụrụ m ka a ga-edekwasịkwa nʼihu ya.
REV 3:13 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.
REV 3:14 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Laodisia, sị ya: Ndị a bụ okwu Amen, onye kwesiri ntụkwasị obi, na onye bụ ezi onyeama, bụrụkwa isi mmalite ihe niile Chineke kere.
REV 3:15 Amaara m ọrụ gị niile, na ị jụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ. Ọ gaara adị nnọọ mma ma asị na ị na-ajụ oyi ma ọ bụkwanụ na-ekpo ọkụ.
REV 3:16 Nʼihi nke a, ebe ị na-ajụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ, ihe ị dị bụ ṅaraṅara. Nʼihi ya, aga m esi nʼọnụ m gbụpụ gị.
REV 3:17 Nʼihi na ị na-asị, ‘abụ m ọgaranya, nwezuo ihe niile. Mkpa ihe ọbụla akpakwaghị m.’ Ma ị ghọtaghị na onye gba aka ka ị bụ. Ị bụ onye e kwesiri imere ebere. Ị bụkwa ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ.
REV 3:18 Ana m adụ gị ọdụ ka ịzụta ezigbo ọlaedo nʼaka m, bụ ọlaedo a nụchara anụcha nʼime ọkụ. Mgbe ahụ, ị ga-abụkwa ọgaranya nʼezie. Ị gaara esitekwa nʼaka m zụta akwa ọcha na-enweghị ntụpọ ka ị ghara ịgba ọtọ, ka ihere gharakwa ime gị. Ka ị zụrụkwa ezigbo ọgwụ ọrịa anya tee, ka ibido ịhụ ụzọ nke ọma.
REV 3:19 Ndị m hụrụ nʼanya ka m na-abara mba na-enyekwa ha ahụhụ. Ya mere, nwee ịnụ ọkụ nʼobi, chegharịakwa.
REV 3:20 Lee, ana m eguzo nʼọnụ ụzọ na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọbụla anụ olu m ma meghee ụzọ, aga m abata soro ya rikọọ ihe, ya onwe ya ga-esokwa m rie ihe.
REV 3:21 Onye ọbụla na-emeri emeri, ka mụ ga-enye ikike ka o soro m nọdụ nʼocheeze m. Ọ bụladị dịka m meriri sorokwa Nna m nọdụ nʼocheeze ya.
REV 3:22 Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.”
REV 4:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, eleliri m anya m hụ ọnụ ụzọ dị nʼeluigwe ka e meghere ya. Ụda olu ahụ m nụrụ na mmalite dara ọzọ, dị ka ụda opi ike sị m, “Bịa, gbagota nʼebe a, ka m gosi gị ihe ga-emezuriri mgbe ihe ndị a gasịrị.”
REV 4:2 Nʼotu oge ahụ, e mere ka m nọọ nʼime mmụọ, ma lee, ahụrụ m onwe m nʼeluigwe, hụkwa ka e debere otu ocheeze nke otu onye na-anọkwasị nʼelu ya.
REV 4:3 Ụdịdị onye nọkwasịrị nʼocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dịka nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa na kanelian. Eke na egwurugwu dịka nkume oke ọnụahịa. Emeralụdụ gbara ocheeze ahụ gburugburu.
REV 4:4 Iri ocheeze abụọ na anọ ọzọ, gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu. Ndị nọkwasịrị nʼocheeze ndị a bụ iri ndị okenye abụọ na anọ, ndị yi uwe ọcha. Ha kpukwa okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha.
REV 4:5 Mgbe ahụ, ụda dịka ụda egbe eluigwe, ya na amụma na-egbuke sitere nʼocheeze ukwu ahụ na-ada na-achapụtakwa. Nʼihu ocheeze ukwu ahụ, e nwere oriọna asaa na-enwu ọkụ. Oriọna ndị a bụ mmụọ asaa nke Chineke.
REV 4:6 Nʼihu ocheeze ahụ e nwere ihe dịka oke osimiri e ji enyo mee, nke na-enwu dịka kristal. Nʼetiti ihu ocheeze ahụ na gburugburu ya, e nwere anụ anọ dị ndụ nwere anya nʼakụkụ ahụ ha niile, ihu na azụ.
REV 4:7 Nke mbụ nʼime anụ ndị ahụ dị ndụ nwere oyiyi dịka ọdụm. Nke abụọ dịka ehi. Nke atọ nwere ihu yiri nke mmadụ. Nke anọ dịka ugo gbasapụrụ nku ya na-efe efe.
REV 4:8 Nke ọbụla nʼime ihe anọ ndị a dị ndụ nwere nku isii. Anya jupụtara nʼahụ ha niile na nʼime ha, ọ bụladị nʼokpuru nku ha. Ehihie na abalị niile, ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị,
REV 4:9 Mgbe ọbụla anụ ndị ahụ dị ndụ na-enye onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi otuto na nsọpụrụ na ekele,
REV 4:10 iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nʼala nʼihu onye ahụ nọ nʼocheeze na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ha niile nʼotu nʼotu na-atụda okpueze ha nʼihu ya na-abụ abụ na-asị,
REV 4:11 “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, kwesiri ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike. Nʼihi na gị onwe gị kere ihe niile, ọ bụkwa site nʼọchịchọ gị ka e ji kee ha, ma meekwa ka ha dịrị ndụ.”
REV 5:1 Mgbe ahụ, ahụrụ m akwụkwọ e dere ihe ihu na azụ, nke a fụkọrọ afụkọ, kakwasịkwa ya akara asaa, ka ọ dị nʼaka nri onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ocheeze ahụ.
REV 5:2 Ahụkwara m otu mmụọ ozi dị ukwuu, ka ọ na-ekwusa okwu nʼoke olu na-asị, “Ọ bụ onye kwesiri ịnyakapụ akara ndị a ma saghee akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ?”
REV 5:3 Ma ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ilenye ya anya a hụrụ nʼeluigwe, maọbụ nʼụwa, maọbụ nʼokpuru ụwa.
REV 5:4 Akwara m akwa nʼobi ilu nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla a hụrụ tozuru oke ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ileba anya nʼime ya.
REV 5:5 Mgbe ahụ, otu onye nʼime ndị okenye ahụ gwara m sị, “Akwala akwa. Lee, Ọdụm ebo Juda, bụ mgbọrọgwụ Devid, emeriela. Ọ pụrụ ịnyakapụ akara asaa ahụ ma saghekwaa akwụkwọ ahụ.”
REV 5:6 Mgbe ahụ, ahụrụ m Nwa Atụrụ na-eguzo nʼetiti ocheeze ahụ dịka e gburu ya egbu. Anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ gbara ya gburugburu. O nwekwara mpi asaa na anya asaa, nke bụ mmụọ asaa nke Chineke, ndị e zipụrụ nʼime ụwa niile.
REV 5:7 Ọ gara nʼihu were akwụkwọ ahụ site nʼaka nri onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ.
REV 5:8 Mgbe ọ weere ya, anụ anọ ahụ dị ndụ na iri ndị okenye abụọ na anọ ndị ahụ dara nʼala nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha niile nʼotu nʼotu jikwa ụbọ akwara na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe jupụtara nʼime ha bụ ụda na-esi isi ụtọ, bụ ekpere ndị nsọ.
REV 5:9 Ha na-abụ abụ ọhụrụ na-asị, “I kwesiri ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara ya, nʼihi na e gburu gị, ma site nʼọbara gị, ị gbataara Chineke ndị mmadụ, ndị si nʼebo niile, na asụsụ niile, na ndị niile, na mba niile.
REV 5:10 Ị chịkọtaala ha, mee ha otu alaeze na ndị nchụaja na-ejere Chineke anyị ozi. Ha ga-achịkwa achị nʼụwa.”
REV 5:11 Mgbe ahụ, elere m anya, hụ ma nụkwa olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi, nke ọnụọgụgụ ha ruru puku kwụrụ puku, na nde kwụrụ nde. Ha gbara ocheeze ahụ gburugburu, na anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ.
REV 5:12 Ha na-abụ abụ nʼoke olu na-asị, “O kwesiri bụ Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu ịnara ike na akụnụba na amamihe na ike na nsọpụrụ na otuto na ngọzị.”
REV 5:13 Mgbe ahụ, anụrụ m ka ihe niile nọ nʼeluigwe na ndị nọ nʼụwa na ndị nọ nʼokpuru ụwa, na ndị nọ nʼokpuru oke osimiri na-eti mkpu abụ na-asị, “Ka ngọzị, na nsọpụrụ niile, na otuto niile, na ike niile dịrị onye ahụ na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, na Nwa Atụrụ ahụ
REV 5:14 Anụ anọ ahụ dị ndụ zakwara sị, “Amen!” Ndị okenye ahụ dakwara nʼala nʼihu ya kpọọ isiala nye ya.
REV 6:1 Ahụrụ m mgbe Nwa atụrụ ahụ meghere otu nʼime akara asaa ahụ. Otu nʼime anụ anọ ahụ dị ndụ tiri mkpu dịka a ga-asị na ọ bụ egbe eluigwe sị, “Bịa!”
REV 6:2 Mgbe m lere anya, ahụrụ m ịnyịnya dị ọcha. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ụta nʼaka ya. A tụkwasịkwara okpueze nʼisi ya dịka onye agha na-emeri emeri mgbe niile.
REV 6:3 Mgbe o meghere akara nke abụọ, ngwangwa, anụrụ m ka anụ nke abụọ ahụ nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ tiri mkpu sị, “Bịa!”
REV 6:4 Mgbe ahụ, ịnyịnya ọzọ na-acha ọbara ọbara pụtara. E nyere onye nọkwasịrị nʼelu ya ike iwepụ udo nʼụwa nakwa ime ka ụmụ mmadụ na-egburita ibe ha. E nyekwara ya mma agha dị ukwuu.
REV 6:5 Ma mgbe o meghere akara nke atọ, anụrụ m ka anụ nke atọ ahụ dị ndụ kwuru, “Bịa!” Ahụrụ m ịnyịnya dị ojii. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ihe ọtụtụ abụọ nʼaka ya.
REV 6:6 Anụkwara m ihe dị ka olu nke sitere nʼetiti anụ anọ ahụ dị ndụ na-adapụta sị, “Otu ihe ọtụtụ kilo nke ọka wiiti bụ ụgwọ ọrụ otu ụbọchị, ihe ọtụtụ kilo atọ nke ọka balị bụkwa ụgwọ ọrụ otu ụbọchị. Ya mere, unu emebikwala mmanụ oliv na mmanya.”
REV 6:7 Mgbe o meghere akara nke anọ, anụrụ m ka anụ nke anọ dị ndụ sịrị, “Bịa!”
REV 6:8 Elere m anya ma hụ ịnyịnya na-acha ntụntụ nʼihu m. Aha onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ Ọnwụ na Ọkụ ala mmụọ na-esokwa ya nʼazụ. E nyere ha ike nʼebe otu ụzọ nʼụzọ anọ nke ụwa dị ka ha jiri mma agha na ụnwụ, na ọrịa ọjọọ na anụ ọhịa gbuchapụ ndị bi nʼime ha.
REV 6:9 Ma mgbe ọ meghere akara nke ise, ahụrụ m nʼokpuru ebe ịchụ aja mkpụrụobi ndị niile e gburu egbu nʼihi okwu Chineke na nʼihi ịgba ama nke ha jidesiri ike.
REV 6:10 Ha ji oke olu tie mkpu na-asị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, onye dị nsọ na onye eziokwu, ruo olee mgbe ka ị na-eche ikpe ụwa na ndị bi nʼime ya ikpe ma bọọkwa ọbọ nʼisi ha maka ọbara anyị ha wufuru?”
REV 6:11 E nyere ha nʼotu nʼotu uwe ọcha, a gwakwara ha ka ha zuru ike nwa oge nta, tutu ruo mgbe ọnụọgụgụ ndị ozi ibe ha na ụmụnna ha a ga-egbu dịka e gburu ha ga-ezu.
REV 6:12 Anọkwa m na-ele anya mgbe o meghere akara nke isii ahụ. Nke a mere ka oke ala ọma jijiji dịrị. Anyanwụ gbara ọchịchịrị dị ka akwa mkpe e jiri ajị mee. E mekwara ka ọnwa chaa uhie uhie dịka ọbara.
REV 6:13 Mgbe ahụ, kpakpando dị na mbara eluigwe malitere ịdapụ nʼala dịka mkpụrụ osisi fiig na-achaghị acha si adapụ mgbe oke ifufe na-efegharị ya.
REV 6:14 Mbara eluigwe gabigara, dịka akwụkwọ mgbe a na-apịakọta ya. Ugwu niile na agwa etiti niile ka e wepụkwara site nʼọnọdụ ha.
REV 6:15 Ndị eze niile nke ụwa na ndị nọ nʼọchịchị dị iche iche, na ndị ọgaranya, na ndị nọ nʼọnọdụ dị elu, na ndị ọchịagha, na ndị mmadụ niile dị iche iche, ndị ukwu ma ndị nta, ndị ohu na ndị nwe onwe ha, ha niile gara zoo onwe ha nʼime ọgba nkume na nʼokpuru ugwu,
REV 6:16 ha na-eti mkpu na-arịọ ugwu ndị ahụ na-asị, “Dakwasịnụ anyị zoo anyị ka onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ocheeze ahụ hapụ ịhụ anyị, ka oke iwe nke Nwa Atụrụ ahụ hapụ ịbịakwasị anyị.
REV 6:17 Nʼihi na, lee oke ụbọchị iwe ha abịala, onye pụrụ ịgbanarị ya?”
REV 7:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nʼakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọbụla ghara ife nʼelu ala, na nʼelu osimiri, na nʼelu osisi.
REV 7:2 Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara Chineke dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri,
REV 7:3 na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.”
REV 7:4 Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel.
REV 7:5 Ndị a kara akara site nʼebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Gad dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
REV 7:6 E sitere nʼebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sitekwara nʼebo Naftalị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). E sitere nʼebo Manase họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
REV 7:7 Ndị si nʼebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sitere nʼebo Livayị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
REV 7:8 E sitere nʼebo Zebụlọn họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Josef dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sikwa nʼebo Benjamin dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
REV 7:9 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha.
REV 7:10 Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị, “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.”
REV 7:11 Ndị mmụọ ozi niile ahụ guzoro ocheeze ahụ gburugburu, ha na ndị okenye ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ. Ha dara, kpuo ihu ha nʼala nʼihu ocheeze ahụ feekwa Chineke ofufe,
REV 7:12 na-asị, “Amen! Ngọzị niile na otuto niile, na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niile na ike niile na ume niile, dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.”
REV 7:13 Mgbe ahụ, otu nʼime ndị okenye ahụ zara m sị, “Ị maara ndị ahụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ, ebee ka ha siri pụta?”
REV 7:14 Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ.
REV 7:15 Ọ bụ nke a mere, “ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya. Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ ga-ekpuchikwa ha.
REV 7:16 ‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla. Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’ okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ.
REV 7:17 Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha; ‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’ ‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’”
REV 8:1 Mgbe o meghere akara nke asaa, akụkụ niile nke eluigwe dara jụụ ruo ihe dị ka iri nkeji atọ.
REV 8:2 Ahụrụ m ndị mmụọ ozi asaa, ndị na-eguzo nʼihu Chineke. E nyere ha opi ike nʼotu nʼotu.
REV 8:3 Mmụọ ozi ọzọ nke ji ite igwe ntakịrị e ji ọlaedo kpụọ bịara guzo nʼihu ebe ịchụ aja. E nyere ya ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ ka o jiri chụọ aja, ya na ekpere ndị nsọ niile, nʼebe ịchụ aja e jiri ọlaedo wuo, nʼihu ocheeze ahụ.
REV 8:4 Anwụrụ ọkụ nke ihe ahụ na-esi isi ụtọ, ya na ekpere ndị nsọ sitere nʼaka mmụọ ozi ahụ rigoo elu nʼihu Chineke.
REV 8:5 Mgbe ahụ kwa, mmụọ ozi ahụ weere ọkụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ tinye ya nʼime ite igwe ntakịrị ahụ, tụda ya, ka ọ danye nʼime ụwa. Mgbe o mere nke a, ụzụ egbe eluigwe dara, amụma gbukwara nʼụzọ dị oke egwu. Ala ọma jijiji dakwasịkwara ebe niile nʼụwa.
REV 8:6 Mgbe ahụ, ndị mmụọ ozi asaa ahụ ndị ji opi asaa ahụ jikeere onwe ha ịfụ opi ike ahụ.
REV 8:7 Mgbe mmụọ ozi nke mbụ fụrụ opi ike ya, a tụdara mkpụrụ mmiri na ọkụ a gwakọtara ya na ọbara nʼime ụwa. Nke a mere ka otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke osisi rechapụrụ ọkụ, e rechapụkwara ahịhịa ndụ niile ọkụ.
REV 8:8 Mgbe mmụọ ozi nke abụọ fụkwara opi ike ya, a tụdara ihe yiri ugwu dị ukwuu na-enwu ọkụ nʼime osimiri. Nke a mere ka otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere osimiri niile chagharịa ghọọ ọbara.
REV 8:9 Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ihe niile dị ndụ dị nʼime osimiri nwụrụ. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere ụgbọ mmiri niile dị nʼelu osimiri lara nʼiyi.
REV 8:10 Mgbe mmụọ ozi nke atọ fụrụ opi ike ya, otu kpakpando dịkarịsịrị ukwuu nke na-enwu dị ka ọwaọkụ sitere na mbara eluigwe danye nʼime otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere iyi niile na isi iyi niile.
REV 8:11 Aha kpakpando ahụ bụ Ilu ilu. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmiri malitere ilu ilu, ọtụtụ mmadụ nwụrụ nʼihi mmiri a na-elu ilu.
REV 8:12 Mgbe mmụọ ozi nke anọ fụrụ opi ike ya, e mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere anyanwụ gbaa ọchịchịrị. Otu a kwa, otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere ọnwa gbara ọchịchịrị. Ya na otu akụkụ nʼime atọ e kere kpakpando niile. Nke a mere ka anyanwụ hapụ inyekwa ìhè ya nʼuju dịka o si eme na mbụ. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere ehihie ghọkwara oke ọchịchịrị, ọ dịkwa otu a nʼoge anyasị.
REV 8:13 Elere m anya, hụ ma nụkwa otu ugo ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe na-eti mkpu nʼolu ike na-asị, “Ahụhụ! Ahụhụ! Ahụhụ dịrị mmadụ niile bi nʼụwa nʼihi ụda opi ike nke ndị mmụọ ozi atọ ndị a ga-afụ.”
REV 9:1 Mgbe mmụọ ozi nke ise ahụ fụrụ opi ike ya, ahụrụ m otu kpakpando si nʼeluigwe daa nʼala. E nyere ya ihe ọtụghe igodo nke e ji atụghe olulu nke Abis ahụ.
REV 9:2 Mgbe o meghere olulu Abis ahụ, anwụrụ ọkụ dị ukwu sitere nʼime ya pụta dịka anwụrụ ọkụ si nʼọkụ icheku ọkụ ya dị ukwuu, mee ka oke ọchịchịrị kpuchie ihu anyanwụ na mbara eluigwe.
REV 9:3 Igurube sitere nʼanwụrụ ọkụ ahụ pụta fedakwasa ụwa. E nyekwara ha ike ịta mmadụ ọbụla dịka akpị si agba mmadụ.
REV 9:4 E nyere ha iwu si ha emebila ahịhịa ndụ ọbụla, maọbụ osisi na ihe ọbụla a kụrụ nʼala. Kama ọrụ ha bụ ịbịakwasị mmadụ ọbụla na-enweghị akara Chineke nʼegedege ihu ya.
REV 9:5 Iwu e nyere ha abụghị ka ha gbuo ndị a, kama ọ bụ ka ha mekpaa ha ahụ ọnwa ise. Mmekpa ahụ ha dịka ahụ ụfụ na nhụju anya nke akpị mgbe ọ gbara mmadụ.
REV 9:6 Nʼime ụbọchị ndị ahụ, ọtụtụ mmadụ ga-achọ iji aka ha gbuo onwe ha ma ha agaghị enwe ike mee ya. Agụụ ịnwụ ọnwụ ga-agụ ha, ma ọnwụ ga-esi nʼebe ha nọ wezuga onwe ya.
REV 9:7 Igurube ndị a nwere oyiyi dị ka ịnyịnya a kwadebere maka ibu agha. Ha nwere ihe yiri okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha. Ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ.
REV 9:8 Agịrị isi ha dịka agịrị isi ụmụ nwanyị. Eze ha dịkwa ka eze ọdụm.
REV 9:9 Ha yikwasịrị onwe ha ihe ikpuchi obi dịka nke e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka ụda nzọ ụkwụ ọtụtụ ịnyịnya nke ụgbọ agha na-esekpu na-abanye nʼọgbọ agha.
REV 9:10 Ha nwere ọdụdụ dịka akpị. Ma ike niile e nyere ha bụ imerụ ndị mmadụ ahụ ọnwa ise site nʼike dị nʼọdụdụ ha.
REV 9:11 Ha nwere mmụọ ozi nke Abis, onye na-achịkọta ha dịka eze. Aha ya nʼasụsụ Hibru bụ Abadọn, ma nʼasụsụ Griik ọ bụ Apolion.
REV 9:12 Ahụhụ nke mbụ agafeela, ebe ahụhụ abụọ ọzọ na-abịa nʼihu.
REV 9:13 Mgbe mmụọ ozi nke isii fụrụ opi ike ya, anụrụ m olu sitere na mpi anọ ahụ dị nʼebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo wuo, nke dị nʼihu ocheeze Chineke,
REV 9:14 na-agwa mmụọ ozi nke isii ahụ, nke ji opi ike okwu, “Tọpụ mmụọ ozi anọ ndị ahụ e kere agbụ nʼebe osimiri Yufretis dị.”
REV 9:15 A tọhapụrụ ndị mmụọ ozi anọ ahụ, ndị e jibu eji na njikere maka oge awa ahụ, na ụbọchị ahụ, na ọnwa ahụ, na afọ ahụ, iji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ.
REV 9:16 Ndị agha ahụ, ọnụọgụgụ ha bụ narị nde abụọ. Anụrụ m mgbe e kwuru ole ha dị.
REV 9:17 Nʼime ọhụ m, ahụrụ m ịnyịnya ha, hụkwa ndị nọkwasịrị ha nʼelu. Ndị nọ nʼelu ịnyịnya ndị a yi ihe ikpuchi obi nke ụfọdụ nʼime ha na-acha ọbara ọbara. Ụfọdụ na-acha dịka akpụkpọ eluigwe, ụfọdụ na-acha odo odo. Ụfọdụ na-acha dịka anwụrụ ọkụ. Isi ịnyịnya ha dịka isi ọdụm, anwụrụ ọkụ na ọkụ na nkume ọkụ sị ha nʼọnụ na-apụta.
REV 9:18 E sitere nʼihe mmekpa ahụ ndị a, ire ọkụ, anwụrụ ọkụ na nkume ọkụ na-adịghị anyụ anyụ, ka ha ji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ niile bi nʼụwa.
REV 9:19 Ike ịnyịnya ndị a dị nʼọnụ ha, na ọdụdụ ha. Ọdụdụ ha dị ka agwọ, nwee isi agwọ nke ha ji emerụ mmadụ ahụ.
REV 9:20 Ma ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ, bụ ndị a na-egbughị site nʼihe ntaramahụhụ ọrịa ndị a, echegharịghị site nʼọrụ aka ha maọbụ ịkwụsị ife mmụọ ọjọọ ofufe. Ha jụkwara ịkwụsị ife arụsị ha niile nke ha ji ọlaedo na ọlaọcha na bronz na igwe na nkume na osisi kpụọ. Chi ndị na-apụghị ịhụ ụzọ, maọbụ ịnụ ihe, maọbụ ije ije.
REV 9:21 Ha echegharịghị site nʼigbu mmadụ ha, maọbụ ụzọ mgbaasị ha, maọbụ ndụ ịkwa iko ha, na izu ohi ha pụta.
REV 10:1 Ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ dị oke egwu ka o si nʼeluigwe na-arịdata. Igwe ojii gbara ya gburugburu. Eke na egwurugwu dịkwa ya nʼisi. Ihu ya na-egbukwa maramara dịka anyanwụ. Ụkwụ ya na-acha dịka ogidi na-enwu ọkụ.
REV 10:2 O ji akwụkwọ ntakịrị a fụkọtara afụkọta nʼaka ya. Otu ụkwụ ya, nke aka nri ya, ka ọ zọnyere nʼime osimiri, ma ụkwụ nke aka ekpe ya ka ọ zọkwasịrị nʼelu ala.
REV 10:3 O ji oke olu, nke dara ụda dịka ịgbọ ụja ọdụm, tie mkpu, egbe eluigwe asaa gbara otu mgbe ahụ.
REV 10:4 Mgbe m chọrọ idetu ihe egbe eluigwe ndị a kwuru, anụrụ m otu olu si nʼeluigwe na-ekwu, “Edela ihe ahụ nʼakwụkwọ, nʼihi na-achọghị ka ndị ọzọ mata okwu ahụ egbe eluigwe ndị ahụ kwuru.”
REV 10:5 Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nke m hụrụ zọkwasịrị ụkwụ ya nʼelu osimiri, na nʼala akọrọ ahụ, chịlịri aka ya abụọ elu,
REV 10:6 were onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi. Ya bụ onye ahụ kere eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha, na oke osimiri, na ndị niile bi nʼime ha, sị na oge ezuola. Na o kwesikwaghị ka a tufuo oge ọbụla.
REV 10:7 Nʼụbọchị ahụ, mgbe ndị mmụọ ozi asaa ahụ ga-afụ opi ike ha, ihe omimi niile nke Chineke ga-emezu, dịka ọ gwara ndị ohu ya bụ ndị amụma.
REV 10:8 Olu nke ahụ m nụrụ mbụ sitere nʼeluigwe gwa m okwu ọzọ, na-asị, “Gaa nara mmụọ ozi ahụ guzo nʼelu oke osimiri na ala akọrọ, akwụkwọ ahụ aseghere aseghe nke o ji nʼaka ya.”
REV 10:9 Ejekwuru m mmụọ ozi ahụ gwa ya ka o nye m akwụkwọ nta ahụ. Ọ sịrị m, “Nara ya, taa ya. Ọ ga-eme ka afọ gị luo ilu, ma ‘nʼọnụ gị, ọ ga-atọ gị ụtọ dịka mmanụ aṅụ.’”
REV 10:10 Ya mere, anaara m ya akwụkwọ nta ahụ site nʼaka mmụọ ozi ahụ taa ya. Ọ tọrọ ụtọ dịka mmanụ aṅụ nʼọnụ m, ma mgbe m lodara ya, afọ m bidoro ilu ilu.
REV 10:11 Mgbe ahụ ha sịrị m, “Ị ghaghị ibu amụma ọzọ banyere ọtụtụ mmadụ, na ọtụtụ mba, na ọtụtụ asụsụ na ọtụtụ ndị eze.”
REV 11:1 Enyere m ihe ọtụtụ osisi achara e ji atụ ihe. Agwara m sị m, “Gaa tụọ ụlọnsọ ukwu Chineke, ma tụọkwa ebe ịchụ aja dị nʼụlọnsọ ahụ, gụọ ọnụọgụgụ ndị niile na-akpọ isiala nʼebe ahụ.
REV 11:2 Ma atụkwala ogige nke dị na mpụta ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ewerela ya nye ndị mba ọzọ. Ha ga-azọtọkwa obodo nsọ ahụ ụkwụ iri ọnwa anọ na abụọ.
REV 11:3 Aga m enye mmadụ abụọ ndị ga-agbara m ama ike ka ha buo amụma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260), ha ga-eyi akwa mkpe.”
REV 11:4 Ndị a bụ osisi oliv abụọ ahụ na ihe ịdọba oriọna abụọ ahụ, ndị na-eguzo nʼihu Onye nwe ụwa.
REV 11:5 Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, ọkụ ga-esi ha nʼọnụ pụta rechapụ ndị iro ha. Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, a ga-egbu ya nʼụzọ dị otu a.
REV 11:6 A ga-enyekwa ha ike imechi eluigwe ime ka mmiri ozuzo ọbụla ghara izo nʼụwa nʼime afọ atọ na ọkara ahụ ha ga-ebu amụma ha. A ga-enyekwa ha ike ime ka osimiri na mmiri nta niile ghọọ ọbara. Ha ga-enwekwa ike ime ka ụdị ọrịa dị iche iche bịakwasị ụwa niile nʼoge ọbụla ha chepụtara nʼobi ha.
REV 11:7 Mgbe ha gbazuru ama ha, anụ ọhịa ahụ, nke na-esite nʼime olulu Abis ahụ ga-ebuso ha agha merie ha, gbukwaa ha.
REV 11:8 Mgbe ha nwụchara, ozu ha ga-atọgbọrọ nʼokporoụzọ nke obodo ukwu ahụ nke a na-akpọ na mmụọ Sọdọm na Ijipt, ebe a kpọgburu Onyenwe ha nʼobe.
REV 11:9 A gaghị ekwenyekwa ka onye ọbụla lie ozu ha. Ma ndị niile dị iche iche nʼụwa, nʼebo niile, na asụsụ niile, na mba niile ga-agba ozu ha gburugburu ụbọchị atọ na ọkara nʼebe a tọgbọrọ ha na-ele ha anya.
REV 11:10 Ndị niile bi nʼụwa ga-aṅụrị ọṅụ, nyerịta ibe ha onyinye dị iche iche, kpọọ oriri dị iche iche iji ṅụrịa ọṅụ nʼihi ogbugbu e gburu ndị amụma abụọ ahụ, ndị wetaara ha oke nhụju anya.
REV 11:11 Ma mgbe ụbọchị atọ na ọkara gafesịrị, Chineke ga-eme ka Mmụọ ya na-enye ndụ banyekwa nʼime ha, ha bilitere ọtọ, oke egwu jidere ndị niile hụrụ ha.
REV 11:12 Ha nụrụ oke olu si nʼeluigwe daa na-asị, “rigotanụ nʼelu.” Ha siri nʼigwe ojii, rigoro nʼeluigwe ebe ndị iro ha ga-anọ na-ele ha anya.
REV 11:13 Ma nʼotu oge ahụ, nʼotu awa ahụ, ala ọma jijiji dịkarịsịrị oke egwu mara nke mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ iri nke obodo ahụ niile daa. Ndị nwụrụ nʼoge ala ọma jijiji a dịkwa puku mmadụ asaa. Ma ndị niile fọdụrụ sitere nʼoke egwu nye Chineke nke eluigwe otuto.
REV 11:14 Ugbu a ahụhụ nke abụọ ahụ agafeela. Ma mgbe na-adịghị anya, ahụhụ nke atọ na-abịa.
REV 11:15 Ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya, oke olu dị iche iche dara ike ike nʼeluigwe, na-asị, “Alaeze niile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, na nke Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”
REV 11:16 Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ nọ nʼocheeze ndị ahụ dị nʼihu ocheeze Chineke dara nʼala kpọọ isiala nye Chineke,
REV 11:17 na-asị, “Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-adị, na onye dịkwaarị, nʼihi na i werela oke ike gị niile nʼaka gị malitekwa ịchị ọchịchị.
REV 11:18 Mba niile were oke iwe megide gị, ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ. Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe na ịkwụghachi ndị ohu gị bụ ndị amụma ụgwọ ọrụ ha, na ndị nsọ na ndị gị niile, bụ ndị na-atụ egwu aha gị, bụ ndị dị nta na ndị dị ukwuu. Oge eruokwala mgbe ịla nʼiyi ndị na-emebi ụwa ga-adị.”
REV 11:19 Mgbe ahụ kwa, e meghere ụlọnsọ Chineke nke dị nʼeluigwe. A hụkwara igbe ọgbụgba ndụ nʼime ya. Nʼotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji na akụmmiri igwe mere mkpọtụ nke ukwuu.
REV 12:1 Oke ihe ịrịbama pụtara ihe nʼeluigwe, otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dịka uwe. Ọnwa dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpueze nwee kpakpando iri na abụọ dịkwa ya nʼisi.
REV 12:2 Ọ dị ime, na-etikwa mkpu nʼihi ahụhụ na ihe ụfụ nke ọmụmụ nwa.
REV 12:3 Mgbe ahụ, ihe ama ọzọ pụtara ihe nʼeluigwe, agwọ ochie nke dị ukwuu na-acha uhie uhie a na-akpọ dragọn, nke nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpueze asaa nʼisi ya.
REV 12:4 O nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke kpakpando niile dị nʼeluigwe, tụda ha nʼala. Ọ bịara guzo nʼihu nwanyị ahụ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ ma a mụpụta ya.
REV 12:5 Ọ mụpụtara nwantakịrị nwoke, “onye ga-ejikwa mkpara ọchịchị chịa mba niile ọchịchị.” Nʼotu oge ahụ kwa, e si nʼebe ahụ wepụ nwata ahụ were ya gaa nʼebe Chineke nọ nʼeluigwe nʼocheeze ya.
REV 12:6 Ma nwanyị ahụ si nʼebe ahụ gbapụ gbalaa nʼọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka a ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260).
REV 12:7 Mgbe ahụ, agha dapụtara nʼeluigwe. Maikel na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide agwọ ochie ahụ (a na-akpọ dragọn). Dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha nke ha,
REV 12:8 ma e meriri ha, ha enwekwaghị ọnọdụ ọbụla nʼeluigwe.
REV 12:9 Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile.
REV 12:10 Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị, “O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya, ha abụrụla ihe dị ire. Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke.
REV 12:11 Ha lụgburu ya nʼagha site nʼọbara Nwa atụrụ ahụ na site nʼama nke okwu ọnụ ha, nʼihi na ha ahụghị ndụ ha nʼanya karịa, kama ha jikere inye ndụ ha ọbụladị ruo nʼọnwụ.
REV 12:12 Ya mere, ṅụrịanụ ọṅụ eluigwe ma unu ndị niile bi nʼime ya. Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼụwa na osimiri nʼihi na ekwensu abịakwutela unu. O jirila oke ọnụma bịakwute unu. Ọ makwaara na oge a o nwere ehighị nne.”
REV 12:13 Mgbe agwọ ochie ahụ chọpụtara na a chụdala ya nʼụwa, ọ chụsoro nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke ahụ ọsọ.
REV 12:14 Ma e nyere nwanyị ahụ nku abụọ, nke dịka nku oke ugo, ka o jiri gbanarị agwọ ochie ahụ feba nʼime ọzara, ebe a kwadooro ya, na ebe a ga-anọ lezie ya anya afọ atọ na ọnwa isii.
REV 12:15 Ma agwọ ahụ meghere ọnụ ya mee ka mmiri si nʼọnụ ya sọpụta dịka iyi nke ga-ebufu nwanyị ahụ.
REV 12:16 Ma ala nyeere nwanyị ahụ aka. O meghere ọnụ ya loda idee mmiri a nke si nʼọnụ agwọ ahụ sọpụta.
REV 12:17 Mgbe ahụ, agwọ ochie ahụ wesara nwanyị ahụ iwe, pụọ ịga buo agha megide ụmụ ya bụ ndị niile fọdụrụ, bụ ndị niile na-edebe iwu Chineke na ndị na-ekwupụta na ha bụ ndị ama nke Jisọs.
REV 13:1 Agwọ ochie ahụ guzoro nʼakụkụ nʼọnụ oke osimiri ahụ. Ma ahụrụ m otu anụ ọhịa ka o si nʼime oke osimiri na-arịpụta. Anụ ọhịa a nwere isi asaa na mpi iri. Okpueze iri dịkwa nʼelu mpi ndị a. Aha e dekwasịrị nʼisi asaa ahụ nʼotu nʼotu bụ ikwutọ na ikwuhie Chineke.
REV 13:2 Anụ ọhịa a m hụrụ dị ka agụ, ma ụkwụ ya dịka ụkwụ anụ ọhịa bịa. Ọnụ ya dịkwa ka nke ọdụm. Agwọ ochie ahụ nyere ya ike ya, na ocheeze ya na ikike dị ukwuu.
REV 13:3 Otu nʼime isi ya nwere ọnya buru ibu, nke pụrụ iwetara ya ọnwụ, e mere ka ọnya ahụ laa. Ụwa niile sobere anụ ọhịa ahụ nʼazụ nʼịtụnanya.
REV 13:4 Ha kpọrọ isiala nye agwọ ochie ahụ nʼihi na o nyere anụ ọhịa ahụ ikike dị otu a. Ha bidokwara ịkpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ, na-asị, “Ebee ka onye ahụ nọ, nke dị ukwuu karịa ya, onye pụkwara ibu agha megide ya?”
REV 13:5 E nyekwara anụ ọhịa ahụ ọnụ na ike ikwu okwu mpako na ikike ikwulu ekwulu ọnwa iri anọ na abụọ.
REV 13:6 O meghere ọnụ ya malite ikwulu Chineke, na aha ya na ebe obibi ya, na ndụ ahụ bụ ndị bi nʼeluigwe.
REV 13:7 E nyere ya ike ibuso ndị nsọ agha na imeri ha. E nyekwara ya ikike ịchị agbụrụ niile, na ebo niile, na ndị niile, na mba niile na asụsụ niile.
REV 13:8 Ndị niile bi nʼelu ụwa ga-akpọkwa isiala nye ya, bụ onye ọbụla a na-edeghị aha ya nʼime akwụkwọ nke ndụ nke Nwa atụrụ ahụ e gbururị, site nʼoge e kere ụwa.
REV 13:9 Onye nwere ntị ya nụrụ.
REV 13:10 “Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla a ga-adọta nʼagha, ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nʼagha. Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla ga-anwụ site na mma agha, aghaghị iji mma agha gbuo ha.” Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume na iguzosikwa ike nʼokwukwe nke ndị Chineke.
REV 13:11 Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhịa ọzọ dị iche ka o si nʼala na-arịpụta. O nwere mpi nta abụọ dịka mpi Nwa atụrụ, kama ọ na-ekwu okwu dịka agwọ ochie ahụ.
REV 13:12 Ọ na-achị isi nʼọnọdụ anụ ọhịa nke mbụ. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagide ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka ha kpọọ isiala nye anụ ọhịa mbụ ahụ nke a gwọrọ ọnya ya na-eweta ọnwụ.
REV 13:13 Ọ na-emekwa ọtụtụ oke ihe ịrịbama dị iche iche. O mere ọbụladị ka ọkụ si na mbara eluigwe daa nʼụwa nʼihu mmadụ niile.
REV 13:14 O duhiekwara ndị mmadụ bi nʼụwa site nʼọrụ ịrịbama ya niile nke e nyere ya ike ịrụ nʼọnọdụ anụ ọhịa ahụ. Ọ gwakwara ndị niile bi nʼụwa ka ha kpụọ ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ nke e jiri mma agha merụchaa ahụ, ma mechaa dị ndụ.
REV 13:15 E nyere ya ike ikunye ume ndụ nʼime oyiyi nke anụ ọhịa mbụ ahụ, ime ka ihe a kpụrụ akpụ kwuo okwu mekwa ka e gbuo ndị niile na-akpọghị isiala nye ya.
REV 13:16 O nyere iwu ka onye ọbụla, onye ukwu na onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya, nata akara nʼaka nri maọbụ nʼegedege ihu ha.
REV 13:17 Ya mere, ọ dịghị onye ọbụla nwere ike ịzụ ahịa maọbụ ree ahịa ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị akara a, nke bụ aha anụ ọhịa ahụ, maọbụ ihe e ji mara ya, maọbụ ọnụọgụgụ nọchiri aha ya.
REV 13:18 Nke a ka chọrọ amamihe maka ịghọta ya. Ka onye ọbụla nwere ọgụgụisi, gụọ ọnụọgụgụ nke anụ ọhịa ahụ, nʼihi na ọ bụ ọnụọgụgụ mmadụ. Ọnụọgụgụ ahụ bụkwa narị isi na iri isi na isii, ya bụ 666.
REV 14:1 Elere m anya hụ Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo nʼugwu Zayọn. Ya na narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ahụ, bụ ndị e dekwasịrị aha ya na aha Nna ya nʼegedege ihu ha.
REV 14:2 Anụkwara m olu si nʼeluigwe na-ada dịka ụda mmiri si nʼime nkume na-asọpụta, maọbụ dịka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu m nụrụ dịka olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ.
REV 14:3 Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị ahụ guzo, chee ocheeze ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ, na ndị okenye ahụ ihu, na-abụ abụ, ha na-abụ abụ ọhụrụ. Nke naanị ha bụ ndị a gbapụtara nʼụwa pụrụ ịmụta.
REV 14:4 Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nʼebe ụmụ nwanyị dị, nʼihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga. Ha bụ ndị a gbapụtara nʼetiti mmadụ ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ dịka mkpụrụ mbụ.
REV 14:5 Ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a hụrụ nʼọnụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị ịta ụta.
REV 14:6 Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe. O ji oziọma nke ebighị ebi ahụ nʼaka, nke ọ na-aga ikwusara mba niile, na ebo niile, na asụsụ niile na mmadụ niile nọ nʼụwa.
REV 14:7 O jiri oke olu kwuo sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto, nʼihi na oge ikpe ya eruola. Kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri niile.”
REV 14:8 Mgbe ahụ mmụọ ozi nke abụọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “ ‘Ọ daala! Ọ daala, bụ Babilọn obodo ukwu ahụ,’ bụ nke mere ka mba niile ṅụọ mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.”
REV 14:9 Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọbụla na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ si nʼime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nʼegedege ihu maọbụ nʼaka ya,
REV 14:10 ha onwe ha, aghaghị isoro ṅụọ mmanya nke oke iwe Chineke, bụ nke a na-agwaghị agwa gbanye nʼime iko ọnụma ya. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nʼihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ.
REV 14:11 Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya.
REV 14:12 Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume nye ndị nsọ ya, bụ ndị nke Chineke na-erubere iwu ya isi, na-eguzosikwa ike nʼokwukwe ha nʼime Jisọs.”
REV 14:13 Anụkwara m olu nke si nʼeluigwe daa na-asị, dee ihe a nʼakwụkwọ, “Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị nwụrụ nʼime Onyenwe anyị site ugbu a gaa nʼihu.” “E, ha ga-ezu ike site na ndọgbu niile nke ha dọgburu onwe ha, nʼihi na ọrụ ha rụrụ ga-eso ha,” ka Mmụọ Nsọ na-ekwu.
REV 14:14 Elere m anya hụ otu igwe ọcha, nke onye nọdụrụ na ya dịka nwa nke mmadụ. O kpu okpueze e jiri naanị ọlaedo mee, jirikwa mma iwe ihe ubi dị nkọ, nʼaka ya.
REV 14:15 Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi sitere nʼụlọnsọ ukwu pụta, tikuo onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha sị, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nʼihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nʼụwa achaala nke ọma.”
REV 14:16 Ya mere, onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼime ụwa, ghọta ihe dị nʼụwa dịka ihe ubi.
REV 14:17 Mmụọ ozi ọzọ sitekwara nʼụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ.
REV 14:18 Mmụọ ozi ọzọ, nke na-elekọta ọkụ sitekwara nʼebe ịchụ aja ahụ pụta, were olu ike gwa mmụọ ozi ahụ ji mma dị nkọ sị, “Were mma owuwe ihe ubi gị dị nkọ bipụ osisi ụyọkọ mkpụrụ grepu site na vaịnị niile dị nʼụwa, nʼihi na ha niile achaala.”
REV 14:19 Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼụwa, bipụsịa ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ahụ chịkọta ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha.
REV 14:20 A zọchakwara mkpụrụ vaịnị ahụ nʼebe a na-azọcha mkpụrụ vaịnị nke dị nʼazụ obodo. Ọbara si nʼebe ahụ gbapụta dị elu ruo ihe dịka eriri e ji ekegide ịnyịnya nʼisi ime ka ọ gaa ebe achọrọ, ọ bụ ihe ruru narị kilomita atọ nʼogologo.
REV 15:1 Ahụkwara m ihe ịrịbama ọzọ nʼeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ndị mmụọ ozi asaa ji ụzọ ahụhụ asaa. Ha bụ ahụhụ nke ikpeazụ ndị ga-eweta iwe Chineke na ngwụcha.
REV 15:2 Ahụrụ m ihe dịka oke osimiri enyo a gwakọtara ya na ọkụ, na ndị ahụ nweterala mmeri nʼebe anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya, na ọnụọgụgụ aha ya. Ha guzo nʼakụkụ oke osimiri enyo ahụ, jidekwa ụbọ akwara nke Chineke nʼaka ha.
REV 15:3 Ha na-abụ abụ Mosis ohu Chineke, na abụ Nwa atụrụ ahụ. “Ọrụ gị niile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ụzọ gị niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Gị, Eze nke mba niile.
REV 15:4 Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị, onye ga-agharakwa ito aha gị? Nʼihi na ọ bụ naanị gị dị nsọ. Mba niile ga-abịakwa ịkpọ isiala nʼihu gị, nʼihi na emeela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè.”
REV 15:5 Mgbe nke a gasịrị, elere m anya hụ, na e meghere, ụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe, ya bụ, ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
REV 15:6 Mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji ihe ntaramahụhụ asaa sị nʼụlọnsọ ahụ pụta. Ha yi uwe ogho ọcha, akwa ọcha na-enwu ezigbo ọcha. E kekwasịrị ihe okike ọlaedo gburugburu obi ha.
REV 15:7 Otu nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ bunyere mmụọ ozi asaa ndị ahụ efere ọlaedo asaa a gbajuru ọnụma Chineke, bụ onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi.
REV 15:8 Mgbe ahụ ụlọnsọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ si nʼebube na ike Chineke na-apụta. O nweghị onye ọbụla nwere ike ịba nʼụlọnsọ ahụ tutu ruo mgbe ntaramahụhụ asaa nke ndị mmụọ ozi asaa ahụ gwụchara.
REV 16:1 Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼụlọnsọ ahụ na-ada na-agwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ okwu, “Ngwanụ, gaanụ wụsa ihe dị nʼefere ọnụma asaa Chineke ahụ nʼelu ụwa.”
REV 16:2 Mmụọ ozi nke mbụ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu ụwa, ọnya ọjọọ na-egbu oke mgbu bịakwasịrị mmadụ niile nwere akara anụ ọhịa ahụ, na ndị na-akpọrọ oyiyi ya isiala.
REV 16:3 Mmụọ ozi nke abụọ wụsara ihe dị nʼime efere nke ya nʼelu osimiri niile. Otu mgbe ahụ, osimiri niile chagharịrị ghọọ ọbara dịka nke onye nwụrụ anwụ. Nke a mere ka ihe niile dị ndụ nʼime osimiri ahụ nwụọ.
REV 16:4 Mmụọ ozi nke atọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu iyi na nʼelu isi iyi niile. Nke a mere ka ha niile ghọọ ọbara.
REV 16:5 Anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ mmiri niile dị nʼaka ya kwuru okwu sị, “I kpere ikpe ziri ezi, Gị, Onye dị Nsọ, na onye na-adị site na mmalite, na onye na-adịkwa ugbu a.
REV 16:6 Nʼihi na ha wụsara ọbara ndị nsọ gị na ndị amụma gị. Ma ugbu a, i nyela ha ọbara ka ha ṅụọ. Nke a bụkwa ezi ụgwọ ọrụ ha kwesiri ịnata.”
REV 16:7 Mgbe ahụ kwa, anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ na-anọ nʼebe ịchụ aja sịrị, “E, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, ikpe gị niile bụ nke ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.”
REV 16:8 Mmụọ ozi nke anọ pụrụ wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu anyanwụ si otu a mee ka anwụ were okpomọkụ ya chagbuo ndị mmadụ.
REV 16:9 Okpomọkụ ahụ si nʼanyanwụ bịa rere onye ọbụla ọkụ nʼahụ. Nke a mere ka ndị mmadụ bido ịkọcha aha Chineke, onye nwere ike ịchị ihe otiti ndị a, ma ha jụrụ ichegharị nye ya otuto.
REV 16:10 Mmụọ ozi nke ise pụrụ wụkwasị ihe dị nʼefere nke ya nʼelu ocheeze anụ ọhịa ahụ, mee ka alaeze ya jupụta nʼọchịchịrị. Ndị mmadụ tabiri ire ha nʼihi oke ahụ ụfụ.
REV 16:11 Ha kọchara Chineke nke eluigwe nʼihi ihe ụfụ na ọnya bịakwasịrị ha. Ma ha jụrụ ichegharị site nʼajọ ọrụ ha niile.
REV 16:12 Mmụọ ozi nke isii pụkwara wụkwasị ihe dị nʼefere ya nʼelu mmiri ukwu ahụ bụ Yufretis si otu a mee ka mmiri dị nʼime ya taa. Nke a mere ka ọ dịrị ndị eze ahụ si nʼọwụwa anyanwụ mfe.
REV 16:13 Ahụrụ mmụọ atọ rụrụ arụ ndị pụtara ihe nʼụdịdị awọ, ha si nʼọnụ agwọ ochie ahụ na nʼọnụ anụ ọhịa ahụ nwere ike ịrụ ọrụ ịtụnanya pụta, na nʼọnụ onye amụma ụgha ahụ.
REV 16:14 Ha bụ mmụọ nke ajọ mmụọ ndị ahụ na-arụ ọrụ ịrịbama. Ọ bụ ha na-ejekwuru ndị eze ụwa niile ịchịkọta ha maka ibu agha nʼụbọchị ukwu ahụ bụ ụbọchị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
REV 16:15 “Lee! Ana m abịa dịka onye ohi. Ngọzị na-adịrị onye ahụ nọ na-eche nche, ndị yi uwe ha na njikere, ka ọ ghara ijegharị nʼọnọdụ ịgba ọtọ, bụrụ onye ọnọdụ ya na-eweta ihere.”
REV 16:16 Ha kpọkọrọ ndị eze ahụ nʼotu ebe a na-akpọ Amagidọn nʼasụsụ Hibru.
REV 16:17 Mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị nʼefere nke ya nʼikuku, otu olu sitere nʼocheeze dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ daa ụda sị, “Emezuola ya!”
REV 16:18 Mgbe ahụ egbe eluigwe bidoro na-agba na-eme mkpọtụ, amụma bidokwara na-egbu, oke ala ọma jijiji dịkwara nʼụwa, ụdị nke na-adịbeghị site na mgbe e kere ụwa. Ọ bụ ala ọma jijiji kachasị ala ọma jijiji ndị ọzọ njọ.
REV 16:19 Obodo ukwu ahụ kewara ụzọ atọ. Obodo niile dị na mba niile dakwara. Chineke chetara obodo ukwu ahụ bụ Babilọn. O nyere ya iko jupụtara na mmanya nke nʼoke iwe nke ọnụma ya.
REV 16:20 Mgbe ahụ, agwa etiti niile mikpuru, ugwu niile ghọrọ ala dị larịị.
REV 16:21 Mkpụrụ mmiri nke ịdị arọ otu nʼime ha ruru kilogram iri anọ na ọkara, sitere nʼeluigwe na-adakwasị ndị mmadụ. Nke a mekwara ka ha kọchaa Chineke nʼihi ihe ntaramahụhụ nke mkpụrụ mmiri ahụ, nʼihi na ihe ntaramahụhụ ahụ dị nnọọ njọ nke ukwuu.
REV 17:1 Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji efere bịara sị m, “Bịa, aga m egosi gị ahụhụ ga-abịakwasị onye ahụ ụwa niile maara dịka akwụna, onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ọtụtụ mmiri nke ụwa.
REV 17:2 Ndị eze ụwa esorola ya kwaa iko nʼotu ihe ndina, emeekwara ka ndị niile bi nʼụwa bụrụ ndị mmanya ịkwa iko ya na-egbu.”
REV 17:3 O duuru m nʼime mmụọ baa nʼọzara. Nʼebe ahụ ka m nọ hụ otu nwanyị nọkwasịrị nʼelu otu anụ ọhịa na-acha ọbara ọbara. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. Aha ndị e dere anụ ọhịa ahụ nʼahụ bụ naanị okwu ikwulu Chineke.
REV 17:4 Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara, gbarakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa na pieal kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nʼaka ya nke jupụtara nʼihe arụ na ihe ure niile o ji na-akwa iko ya.
REV 17:5 Aha e dekwasịrị ya nʼegedege ihu bụ ihe omimi: Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn, nne ndị na-akwa iko na nke ihe arụ niile nke ụwa.
REV 17:6 Ejikwa m anya m hụ na nwanyị ahụ aṅụjuola ọbara ndị nsọ afọ, ya na ọbara ndị ama Jisọs. Mgbe m hụrụ ya, ọ gbagwojuru m anya.
REV 17:7 Ma mmụọ ozi ahụ sịrị m, “Gịnị mere ihe ị hụrụ ji ju gị anya? Aga m akọwara gị ihe omimi banyere nwanyị a na anụ ọhịa ahụ nke na-ebugharị ya, bụ nke nwere isi asaa na mpi iri.
REV 17:8 Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ, nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị. Ma ọ ga-esi nʼolulu Abis ahụ pụta banye na mbibi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nʼime akwụkwọ ndụ ahụ site nʼoge e kere ụwa anya. Nʼihi na e nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị, ma ọ ga-emesi bịa.
REV 17:9 “Nke a chọrọ uche nke nwere amamihe. Isi asaa ahụ nọchiri anya ugwu asaa ahụ nke nwanyị ahụ na-anọdụ nʼelu ha. Ha na-anọchikwa anya ndị eze asaa.
REV 17:10 Ise nʼime ha adaala, otu ka nọ, nke ọzọ abịabeghị. Mgbe ọ bịara, ọ ga-anọ nwantakịrị oge.
REV 17:11 Anụ ọhịa ahụ nke dịrịị ma ọ dịkwaghị, bụ onye nke asatọ, ọ bụ onye otu ndị eze asaa ahụ ma a lakwara ya nʼiyi.
REV 17:12 “Mpi iri ahụ ị hụrụ nọchiri anya ndị eze iri na-anatabeghị alaeze. Ha na anụ ọhịa ahụ ga-anata ike ọchịchị dịka eze sọọsọ otu awa.
REV 17:13 Ha ji otu obi na-enye anụ ọhịa ahụ ike ha na ịchị isi ha.
REV 17:14 Ha ga-ebu agha megide Nwa Atụrụ ahụ, ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha nʼihi na ọ bụ Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile nakwa Eze kachasị ndị eze niile. Ndị so ya bụkwa ndị a kpọrọ, na ndị a họpụtara, ndị ya kwesikwara ntụkwasị obi.”
REV 17:15 Mgbe ahụ ọ sịrị m, “Mmiri ndị ahụ ị hụrụ, ebe nwanyị akwụna ahụ nọ, bụ ndị mmadụ dị iche iche, igwe mmadụ, na mba dị iche iche na nʼasụsụ dị iche iche.
REV 17:16 Anụ ọhịa ahụ na mpi iri ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwanyị akwụna ahụ asị. Ha ga-agba ya ọtọ, laakwa ya nʼiyi, ha ga-eri anụ ya, werekwa ọkụ rechapụ ya.
REV 17:17 Chineke etinyela ya nʼobi ha imejupụta nzube ya site nʼinwe otu obi nakwa inyefe anụ ọhịa ahụ ikike ọchịchị alaeze ha, tutu ruo mgbe a ga-emezu okwu Chineke.
REV 17:18 Ma nwanyị a ị hụrụ bụ obodo ukwu ahụ na-achị ndị eze niile nke ụwa.”
REV 18:1 Mgbe ihe ndị a niile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼeluigwe na-arịdata. E nyere ya ikike dị ukwuu, ebube ya mekwara ka ihe jupụta nʼụwa.
REV 18:2 O ji olu dị ike tie mkpu, “ ‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’ Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha, nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ.
REV 18:3 Nʼihi na mba niile aṅụọla site na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya. Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko, ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.”
REV 18:4 Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị, “ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ ka unu ghara iketa oke na mmehie ya, ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.
REV 18:5 Nʼihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe. Chineke echetakwala ajọ omume ya niile.
REV 18:6 Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu. Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere. Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ.
REV 18:7 Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi ilu dịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya. Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị, ‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m. Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ, iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’
REV 18:8 Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị, ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ. A ga-eji ọkụ rechapụ ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike.
REV 18:9 “Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya.
REV 18:10 Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị, “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha ya gị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara. Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’
REV 18:11 “Ndị ahịa nke ụwa ga-akwa akwa ruokwa ụjụ nʼihi ya, nʼihi na ọ dịkwaghị onye na-azụ ihe ahịa ha ọzọ.
REV 18:12 Ngwa ahịa ọlaedo gị, na ọlaọcha, na ọla e ji achọ mma na nkume oke ọnụahịa, ezi akwa ọcha, na akwa uhie uhie, na akwa lọrịlọrị, na akwa odo odo, osisi niile na-esi isi ọma, ihe niile e ji ọdụ enyi mee, ngwa ahịa niile e ji osisi niile dị oke ọnụahịa mee, bronz, igwe na nkume mabụl.
REV 18:13 Ha na ụda sinamọn na mmanụ otite nke ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, máá na frankisens, mmanya na mmanụ oliv, ụtụ ọka na wiiti, ehi na atụrụ, ịnyịnya na ụgbọala agha, na ndị na-ere mmadụ ibe ha dịka ohu, na ahụ mmadụ na mkpụrụobi mmadụ.
REV 18:14 “Ha ga-asị, ‘Mkpụrụ ndị ahụ niile nke na-agụ mkpụrụobi agụ e sitela nʼebe ị nọ gabiga. Ihe ọma niile i ji ebi ndụ, na ihe oke ọnụahịa niile i ji azụ afọ gị, efunarịla gị. Apụghị ịchọtakwa ha ọzọ mgbe ọbụla.’
REV 18:15 Ndị ahịa ahụ bara ọgaranya site nʼaka ya, ga-anọ nʼebe dị anya, nʼihi oke egwu nke ntaramahụhụ ya, na-eru ụjụ, na-ebesikwa akwa ike.
REV 18:16 “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu ahụ, nke e yikwasịrị ezi akwa ọcha, nke na-acha odo odo na ọbara ọbara nke nya ihe ịchọ mma nke ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche na nkume pieal dị iche iche.
REV 18:17 Nʼotu awa a ka a lara oke akụ niile ndị a nʼiyi.’ “Ndị niile nwee ụgbọ na-aga nʼoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahịa nʼoke osimiri, na ndị niile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nʼebe tere anya,
REV 18:18 na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼire ọkụ ya na-asị, ‘Olee obodo ọzọ dịka obodo ukwuu a?’
REV 18:19 Ha ga-ekpokwasị aja nʼisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị, “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu a maara aha ya ebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri ghọrọ ndị ọgaranya site nʼakụ dị nʼime ya. Ma ugbu a, nʼotu ntabi anya, ihe niile dị nʼime ya bụ ihe a laara nʼiyi.’
REV 18:20 “Ma gị eluigwe, ṅụrịa ọṅụ nʼihi ihe a dakwasịrị ya, unu ndị nsọ, ṅụrịakwanụ ọnụ, unu ndị amụma na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọnụ. Nʼihi na Chineke ekpeela ya ikpe nʼihi mmeso ya megide unu.”
REV 18:21 Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi dị ukwuu tụtụlitere otu nkume nke dịka nkume igwe nri, tụba ya nʼime oke osimiri, na-asị, “Otu a ka a ga-esi tufuo Babilọn obodo ukwu ahụ, agaghị ahụkwa ya ọzọ.
REV 18:22 Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ. Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ. Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla nʼime gị ọzọ. Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri nʼime gị ọzọ.
REV 18:23 Ìhè nke sitere nʼoriọna agaghị acha nʼime gị ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwunye agaghị adịkwa. Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa, ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa.
REV 18:24 Nʼime ya ka a hụrụ ọbara ndị amụma niile, na nke ndị nsọ niile, na nke ndị ọzọ ahụ niile e gburu nʼụwa.”
REV 19:1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị, “Haleluya! Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị.
REV 19:2 Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa. Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.”
REV 19:3 Ọzọkwa, ha tiri mkpu, “Haleluya! Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.”
REV 19:4 Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Amen, Haleluya!”
REV 19:5 Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị, “Toonu Chineke anyị, unu ndị ohu ya niile, ndị ukwu na ndị nta, unu ndị na-atụ egwu ya.”
REV 19:6 Mgbe ahụ, anụkwara m olu dara ka olu igwe mmadụ dịkwa ka ụzụ mmiri na-ekwo ekwo, dịkwa ka ụda egbe eluigwe dasiri ike na-asị, “Haleluya! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na-achị.
REV 19:7 Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọkwaa anyị ụtọ. Ka anyị nye ya otuto. Nʼihi na ọlụlụ di na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruola, nwunye ya edoziekwala onwe ya.
REV 19:8 E nyela ya ezi akwa ọcha nke na-enweghị ntụpọ ọbụla, na nke dị nnọọ ezi ọcha ka o yikwasị onwe ya.” (Ezi akwa ọcha ahụ nọchiri anya ọrụ ezi omume nke ndị nsọ rụrụ.)
REV 19:9 Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.”
REV 19:10 Adara m nʼala nʼụkwụ ya ịkpọ isiala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesighị ka ị kpọọ isiala nye m nʼihi na abụ m naanị onyeozi ibe gị, na dịka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere Jisọs. Ọ bụ naanị Chineke ka i kwesiri ịkpọ isiala nye. Nʼihi na ọ bụ Mmụọ nke amụma na-agba ama ihe banyere Jisọs.”
REV 19:11 Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha.
REV 19:12 Anya ya na-acha dịka ire ọkụ. Ọtụtụ okpueze dịkwa ya nʼisi. Otu aha nke naanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nʼegedege ihu.
REV 19:13 E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke.
REV 19:14 Usuu ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe ezi akwa ọcha, na-enweghị ntụpọ, nọ nʼelu ịnyịnya ọcha na-eso ya.
REV 19:15 Ọ kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. “Ọ ga-eji mkpara igwe achị ha.” Ọ na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
REV 19:16 Otu aha ka e dere nʼelu uwe ya na nʼelu apata ya: Eze kachasị ndị eze niile, na Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile.
REV 19:17 Mgbe ahụ, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o guzo nʼime anyanwụ na-eti mkpu nʼoke olu, na-akpọku ụmụ nnụnụ niile na-efe nʼetiti mbara eluigwe, “Bịanụ! Zukọọnụ maka oke oriri nke Chineke.
REV 19:18 Bịanụ soro rie anụ ahụ ndị eze, na ndị ọchịagha, na ndịisi agha. Sorokwanụ rie anụ ahụ ịnyịnya na anụ ahụ ndị nọkwasịrị nʼelu ha. Riekwanụ anụ ahụ ndị mmadụ, ndị ukwu na ndị nta, ndị ohu na ndị nweere onwe ha.”
REV 19:19 Mgbe ahụ, ahụrụ m anụ ọhịa ọjọọ ahụ ya na ndị eze niile dị nʼụwa, na ndị agha ha, ka ha zukọtara ibu agha megide onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ahụ na ndị agha ya.
REV 19:20 Ma e jidere anụ ọhịa ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ onye nke nọọrọ nʼihu ya gosi ihe ịrịbama nke o jiri duhie ndị niile natara akara nke anụ ọhịa ahụ, ya na ndị kpọọrọ ihe oyiyi ya isiala. A tụnyere anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ya na ndụ nʼime ọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye.
REV 19:21 Ndị agha ha fọdụrụnụ ka e jikwa mma agha dị nkọ, nke dị nʼọnụ onye ahụ nọ nʼelu ịnyịnya ọcha ahụ gbuo. Ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe rikwara ozu ha.
REV 20:1 Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nʼeluigwe na-arịdata, o ji mkpisi igodo e ji atụghe olulu Abis ahụ. O jikwa eriri igwe dị ukwuu nʼaka ya.
REV 20:2 O jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, kee ya agbụ otu puku afọ.
REV 20:3 Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge.
REV 20:4 Mgbe ahụ, ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nʼelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụobi ndị ahụ e bepụrụ isi nʼihi na ha gbaara Jisọs akaebe, kwusakwa okwu Chineke. Ha akpọbeghị isiala nye anụ ọhịa ahụ maọbụ ihe oyiyi ya. Ha enweghị akara anụ ọhịa ahụ nʼegedege ihu ha, maọbụ nʼaka ha. Ha dịkwa ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst chịa otu puku afọ.
REV 20:5 Nke a bụ mbilite nʼọnwụ nke mbụ. Ndị fọdụrụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ esoghị bilite nʼọnwụ tutu ruo mgbe puku afọ gafesịrị.
REV 20:6 Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nʼọnwụ nke mbụ ahụ. Ọnwụ nke abụọ enweghị ike nʼebe ha nọ, nʼihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa ọchịchị puku afọ.
REV 20:7 Mgbe puku afọ ahụ gafesịrị, a ga-emekwa ka ekwensu si nʼụlọ mkpọrọ ya pụta.
REV 20:8 Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba niile nọ nʼakụkụ anọ nke ụwa, ya bụ Gog na Magog, ọ ga-akpọkọta ha maka agha. Ọnụọgụgụ ha dịka aja dị nʼikpere osimiri.
REV 20:9 Ha biliri agha guzo nʼụwa niile, gbaa ụlọ ikwu nke ndị nsọ Chineke hụrụ nʼanya gburugburu. Ma ọkụ sitere nʼeluigwe gbadata repịa ha.
REV 20:10 Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi.
REV 20:11 Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha.
REV 20:12 Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị.
REV 20:13 Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị.
REV 20:14 Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ.
REV 20:15 Onye ọbụla a na-achọtaghị ebe e dere aha ya nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, ka a tụnyere nʼime ọdọ ọkụ ahụ.
REV 21:1 Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa.
REV 21:2 Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya.
REV 21:3 Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha.
REV 21:4 Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala.”
REV 21:5 Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, “Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Mgbe ahụ, ọ sịkwara, “Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”
REV 21:6 Ọ sịrị m, “E mezuola ihe niile. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ. Aga m enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si nʼisi iyi mmiri nke ndụ dịka ihe onyinye.
REV 21:7 Ndị ọbụla na-emeri emeri ga-enweta ihe nketa ndị a. Aga m abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụ ụmụ m.
REV 21:8 Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.”
REV 21:9 Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, nke ji efere asaa ahụ nke ihe ntaramahụhụ dị nʼime ya bịakwutere m sị m, “Soro m, ka m gosi gị nwaagbọghọ ahụ bụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.”
REV 21:10 O buuru m nʼime Mmụọ buga m nʼotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. O gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata.
REV 21:11 O jupụtara nʼebube Chineke, na-enwu ma na-achakwa dịka nkume dịkarịsịrị oke ọnụahịa, dịka nkume jaspa, na-enwu dịka kristal.
REV 21:12 Mgbidi ya niile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel nʼọnụ ụzọ ama ndị a nʼotu nʼotu.
REV 21:13 Ọnụ ụzọ ama atọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, atọ dị nʼakụkụ ugwu, atọ dị nʼakụkụ ndịda, ebe atọ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
REV 21:14 Mgbidi ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. Nʼelu nkume ndị a nʼotu nʼotu ka e dere aha ndị ozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.
REV 21:15 Onye ahụ na-agwa m okwu ji osisi e ji atụ ihe, nke e ji ọlaedo mee, nʼaka ya. O ji ya tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ama ya, na mgbidi ya.
REV 21:16 Nʼobodo ahụ, enweghị otu akụkụ nʼime akụkụ anọ nke mgbidi ya karịrị ibe ya. Ogologo ya na obodobo ya ha otu. O ji ihe ọtụtụ tụọ ya, ogologo ya na obodobo nakwa ịdị elu ya ha, ọtụtụ ya dị puku kilomita abụọ na narị kilomita abụọ.
REV 21:17 Ọ tụkwara ịdị igbidi nke mgbidi ahụ chọpụta na ọ dị narị nzọ ụkwụ atọ, dịka ihe ọtụtụ nke mmụọ ozi ahụ si gụpụta.
REV 21:18 Ihe e ji rụọ mgbidi ya bụ nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa, jiri ezi ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwu dịka enyo dị ọcha rụọ obodo ahụ.
REV 21:19 E ji nkume niile dị oke ọnụahịa chọọ ntọala mgbidi obodo ahụ mma. Ntọala nke mbụ, bụ nkume a na-akpọ jaspa, ntọala nke abụọ, nkume a na-akpọ safaia, ntọala nke atọ, nkume a na-akpọ kaldoni, nke anọ, nkume a na-akpọ emeralụdụ,
REV 21:20 nke ise, nkume a na-akpọ ọniks, nke isii, nkume a na-akpọ kanelian, nke asaa, nkume a na-akpọ krisolaịt, nke asatọ, nkume a na-akpọ beril, nke itoolu, nkume a na-akpọ topaazi, nke iri, nkume a na-akpọ krisoprez, nke iri na otu, nkume a na-akpọ jasint, nke iri na abụọ, nkume a na-akpọ ametisiti.
REV 21:21 Ọnụ ụzọ ama iri na abụọ ahụ bụ pieal iri na abụọ, ọnụ ụzọ ama ọbụla ka e ji otu nkume pieal rụọ nʼotu nʼotu. Ihe e ji rụọ okporoụzọ dị nʼobodo ahụ bụ naanị ọlaedo a nụchara anụcha ọbụla, nke dị ọcha dịka enyo e hichaziri nke ọma.
REV 21:22 O nweghị ụlọnsọ ukwu ọbụla m hụrụ nʼime obodo ahụ nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọnsọ ukwu obodo ahụ nwere.
REV 21:23 Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ maọbụ ọnwa mụkwasị ya, nʼihi na ebube nke Chineke bụ ìhè ya, oriọna ya bụkwa Nwa atụrụ ahụ.
REV 21:24 Mba niile ga-eji ìhè ya jegharịa. Ndị eze ụwa niile ga-abịakwa webata ebube ha nʼime ya.
REV 21:25 A naghị emechi ọnụ ụzọ ama obodo ahụ emechi. Ha na-eghe oghe ụbọchị niile nʼihi abalị ọbụla adịghịkwa nʼebe ahụ.
REV 21:26 Ebube na nsọpụrụ nke mba niile ka a ga-ewebata nʼime ya.
REV 21:27 Ọ dịkwaghị ihe ọbụla rụrụ arụ ga-abata nʼime ya. Otu a kwa, ọ dịkwaghị onye na-eme ihe arụ, maọbụ onye ụgha ga-abata nʼime ya, kama ọ bụ naanị ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ Nwa Atụrụ ahụ.
REV 22:1 Mmụọ ozi ahụ gosiri m iyi ahụ e si ekute mmiri nke na-enye ndụ nke na-enwu dịka kristal. O sikwa nʼokpuru ocheeze Chineke na Nwa atụrụ ahụ na-asọpụta,
REV 22:2 nʼetiti okporoụzọ ahụ dị nʼobodo ahụ. Nʼakụkụ aka nri na aka ekpe iyi ahụ, a ga-ahụ osisi ahụ na-enye ndụ. Osisi ndị a na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ dị iche iche. Ha na-amịpụta mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa ọbụla. Akwụkwọ osisi ahụ wapụtara bụ ọgwụ e ji agwọ mba niile.
REV 22:3 A gaghị ahụ ihe ọbụla a bụrụ ọnụ nʼime obodo ahụ. Ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ ga-adị nʼobodo ahụ. Ndị ohu ya ga-efekwa ya ofufe.
REV 22:4 Ha ga-ahụkwa ihu ya, a ga-edekwa aha ya nʼegedege ihu ha.
REV 22:5 Abalị agaghị adịkwa ọzọ, ịmụnye oriọna agaghị adịkwa mkpa. Mkpa ìhè anwụ na-enye agaghị adịkwa nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ga-abụ ìhè ha, ha ga-achịkwa achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.
REV 22:6 Mmụọ ozi ahụ gwara m, “Okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu. Onyenwe anyị, bụ Chineke, onye na-enye ndị amụma Mmụọ ya ezitela mmụọ ozi ya igosi ụmụodibo ya ihe ndị ahụ ga-emezu nʼoge na-adịghị anya.
REV 22:7 “Lee, ana m abịa ọsịịsọ. Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-edebe okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ a.”
REV 22:8 Mụ onwe m bụ Jọn, hụrụ ihe ndị a niile, nụkwa ha. Mgbe m hụrụ ma nụchaa ihe ndị a niile, adara m nʼụkwụ mmụọ ozi a gosiri m ha ịkpọ isiala nye ya.
REV 22:9 Ma ọ sịrị m, “Emela ihe dị otu ahụ! Mụ onwe m bụkwa odibo Jisọs dịka gị onwe gị, na dịka ụmụnna gị ndị amụma, na dịka ndị ahụ niile na-edebe okwu niile e dere nʼakwụkwọ a. Kpọọrọ Chineke isiala.”
REV 22:10 Ma ọ sịrị, “Akachila okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ akara, nʼihi na oge adịla nso.
REV 22:11 Ka ndị niile na-eme ajọ omume gaa nʼihu na-eme ajọ omume, ka ndị na-adịghị ọcha gaa nʼihu bụrụ ndị na-adịghị ọcha, ka ndị na-eme ezi ihe gaa nʼihu na-eme ezi ihe, ka ndị dị nsọ gaa nʼihu bụrụ ndị dị nsọ.”
REV 22:12 “Lee, ana m abịa ọsịịsọ! Ụgwọ ọrụ m ga-enye onye ọbụla dịka ọrụ ọ rụrụ si dị dịkwa m nʼaka.
REV 22:13 Abụ m Alfa na Omega. Onye mbụ na Onye ikpeazụ, Mmalite na Ọgwụgwụ.
REV 22:14 “Ngọzị na-adịrị ndị ahụ sara uwe ha mmiri, ka ha si otu a bụrụ ndị na-enweta oke na mkpụrụ si nʼosisi ahụ na-enye ndụ, ndị ga-enwe ike isite nʼọnụ ụzọ ama ahụ baa nʼime obodo ahụ.
REV 22:15 Nʼazụ obodo ka ndị ahụ bụ nkịta nọ, ha na ndị niile na-agba afa, na ndị niile na-akwa iko, na ndị niile na-egbu mmadụ, na ndị niile na-ekpere arụsị, na ndị niile hụrụ ụgha nʼanya ma na-emekwa ya.
REV 22:16 “Mụ onwe m, bụ Jisọs ezitela mmụọ ozi m ka ọ gbara unu ama a nye nzukọ m niile. Ọ bụ m bụ Mgbọrọgwụ na Mkpụrụ Devid. Abụkwa m Kpakpando ụtụtụ ahụ na-enwu enwu.”
REV 22:17 Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọbụla nụrụ okwu a kwuo sị, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa, onye ọbụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ na-akwụghị ụgwọ ọbụla.
REV 22:18 Ana m adọ onye ọbụla nụrụ okwu amụma dị nʼakwụkwọ a aka na ntị, sị, ọ bụrụ na onye ọbụla atụkwasị ihe ọbụla nʼelu ha, Chineke ga-atụkwasịrị onye ahụ ihe ntaramahụhụ ahụ niile e kwuru maka ha nʼakwụkwọ a.
REV 22:19 Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ewepụ okwu ọbụla nʼakwụkwọ amụma a, Chineke ga-ewepụ oke o nwere nʼosisi ahụ na-enye ndụ, na oke o nwere nʼobodo nsọ ahụ, nke e kwuru okwu ha nʼakwụkwọ a.
REV 22:20 Onye ahụ gbara ama ihe ndị a niile na-asị, “Nʼezie, ana m abịa ọsịịsọ.” Amen. Bịa, Onyenwe anyị Jisọs.
REV 22:21 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere ndị nsọ niile. Amen.
