﻿Aịzaya.
64.
Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala, ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị! 
Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi, na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ. Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro gị niile maara aha gị, meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị. 
Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị. 
Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ, ọ dịbeghị ntị ghọtara, o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị, onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha. 
Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka, bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha. Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha, iwe were gị. A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị? 
Anyị niile dịka onye rụrụ arụ, ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi. Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi, mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe. 
Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ; ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị. Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ, meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị. 
Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite. Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile. 
Biko, Onyenwe anyị, anọgidela na-eweso anyị iwe; echetakwala mmehie anyị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Biko, lekwasị anyị anya nʼihi na ndị gị ka anyị bụ. 
Obodo nsọ gị niile aghọọla ọzara; ọ bụladị Zayọn aghọọla ọzara, Jerusalem, ebe tọgbọrọ nʼefu. 
Ụlọnsọ ukwu anyị ahụ mara mma, nke dịkwa nsọ, ebe nna anyị ha nọ too gị, ma feekwa gị ofufe, abụrụla ihe a gbara ọkụ. Ihe niile mara mma nʼime ya alaala nʼiyi. 
Mgbe ihe niile gasịrị, Onyenwe anyị, ị ga-ejisi onwe gị ike? Ị ga-agba nkịtị, taa anyị ahụhụ ebe ọ gafere oke? 
