﻿Abụ Ọma.
131.
Abụ nrigo, nke Devid. O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m, ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m; adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m. 
Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ; dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ, e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m. 
Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. 
