﻿Abụ Ọma.
124.
Abụ nrigo. Nke Devid. A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo, 
a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị, 
mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ; 
idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị, 
ebili mmiri niile gaara ebufu anyị. 
Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị. 
Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị. 
Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa. 
