﻿Abụ Ọma.
121.
Abụ nrigo. Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile, olee ebe inyeaka ga-esi bịara m? 
Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa bịa. 
Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ, onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile; 
nʼezie onye na-eche Izrel nche adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra. 
Onyenwe anyị na-eche gị nche, Onyenwe anyị bụ ndo gị nʼaka nri gị; 
anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie, ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị. 
Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị. Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile. 
Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata, site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi. 
