﻿Abụ Ọma.
102.
Ekpere nke onye nọ na mmekpa ahụ na ọnọdụ ịda mba, na-ekwupụta otu o si dịrị ya nʼihu Onyenwe anyị. Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị; ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị. 
Ezonarịla m ihu gị nʼụbọchị nsogbu m. Gee ntị nʼekpere m, zakwaa m ngwangwa. 
Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ; ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ. 
Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa; ana m echefu iri nri m. 
Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ, enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ. 
Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara, a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị. 
Ana m amụ anya abalị niile; adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ. 
Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị; ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ. 
Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m, anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m 
nʼihi oke iwe gị, i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ. 
Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada. Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa. 
Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi; aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 
Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ, nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola; oge ahụ a kara aka eruola. 
Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị; mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere. 
Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị. 
Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya. 
Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa; ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya. 
Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu, ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị: 
“Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya, o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa, 
ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.” 
Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn; a ga-eto ya na Jerusalem, 
mgbe mba niile na alaeze niile, ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe. 
O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m; o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ. 
Nʼihi ya, ekwuru m sị, “Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ; ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 
Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. 
Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide; ha ga-erichasị dịka akwa ochie. Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya, ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga. 
Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe, ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ. 
Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide; ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.” 
