﻿Abụ Ọma.
29.
Abụ Ọma Devid. Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya. 
Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya; kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya. 
Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri; olu Chineke dị ebube na-ada ike ike, olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe nʼelu oke osimiri. 
Olu Onyenwe anyị dị ike, olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube. 
Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida; Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn. 
Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi, ọ na-eme ka Siriọn wulie elu dịka nwa atụ. 
Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe mgbe amụma na-egbu. 
Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji; Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji. 
Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa. Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!” 
Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri; Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi. 
Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike, ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya. 
