﻿Abụ Ọma.
26.
Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị, biko kpepụta m, nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke; atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi, na-eleghị anya nʼazụ. 
Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m, nyochaa obi m na echiche m. 
Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m. Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị. 
Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla. Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ. 
Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị. Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa. 
Ana m asacha aka m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ, na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị. 
Ana m abụkwa abụ ekele, jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile. 
O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya, ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya. 
Ebibikọtala mụ na ndị mmehie, ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara, 
ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ, aka nri ha jupụtakwara na ngarị. 
Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke; gbapụta m ma meere m ebere. 
Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị; aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ. 
