﻿Job.
18.
Mgbe ahụ Bildad onye Shua zara sị: 
“Ruo ole mgbe ka ị ga-ekwubi okwu ndị a ị na-ekwu? Nwee ezi uche ka anyị kparịtaa ụka. 
Gịnị mere i ji were anyị dịka anụ ọhịa, gụọ anyị dịka ndị na-enweghị uche nʼanya gị? 
Gị onye na-eji iwe adọkasị onwe gị, a ga-ahapụ ụwa nʼihi gị? Ka a ga-enupu oke nkume nʼọnọdụ ha? 
“A na-afụnyụ oriọna nke onye na-emebi iwu; ire ọkụ ya ga-akwụsịkwa inwu enwu, 
ìhè nke dị nʼime ụlọ ikwu ya na-abụ ọchịchịrị, oriọna nke dị nʼakụkụ ya na-anyụkwa. 
Ike agakwaghị adị na nzọ ukwu ya; atụmatụ ya onwe ya ga-atụda ya nʼala. 
Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya; ọ na-akpagharị na-adaba nʼime oghere. 
Ọnya na-ejide ikiri ụkwụ ya, ọnya ahụ na-ejidesi ya ike. 
E zobere ya ụdọ ọnya igbudu nʼala, ihe e ji ejide ya na-echere ya nʼụzọ ya. 
Ihe egwu na-emenye ya ụjọ nʼakụkụ niile, na-agbasokwa nzọ ụkwụ ya niile. 
Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike; mbibi nọkwa na njikere na-eche mgbe ọ ga-ada. 
Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya; ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile. 
Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile. 
Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya; a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya. 
Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala, alaka ya ga-akpọnwụ nʼelu. 
A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ, o nweghị onye ọbụla na-echetakwa aha ya. 
A na-esite nʼìhè chụba ya nʼọchịchịrị, otu a kwa, a na-achụpụkwa ya site nʼụwa. 
O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya, ọ dịghị onye fọdụrụ nʼebe o bi na mbụ. 
Ọnọdụ ya na-eju ndị si nʼọdịda anyanwụ anya; oke egwu na-ejidekwa ndị si nʼọwụwa anyanwụ nʼihi ya. 
Nʼezie, otu a ka ebe obibi nke onye ajọ omume dị, ee, bụ onye ahụ nke na-amaghị Chineke.” 
