﻿Job.
13.
“Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile, ntị m anụla ma ghọtakwa ha. 
Mụ onwe m makwa ihe unu maara; abụghị m onye dị ala nʼebe unu nọ. 
Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu, ka mụ na Chineke rụọkwa ụka banyere okwu m. 
Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ; unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru. 
Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị, nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe. 
Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m; geekwanụ ntị nụrụ okwu si m nʼọnụ na-apụta. 
Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide? Unu ga-esite nʼokwu aghụghọ kwuchitere Chineke ọnụ ya? 
Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe? Unu ga-ekwuchite ọnụ Chineke? 
Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu? Unu pụrụ ịghọgbu ya dịka unu si aghọgbu ndị mmadụ? 
Ọ ghaghị ịbara unu mba ma ọ bụrụ na unu ejiri okwu ụgha chọọ inyere ya aka. 
Ọ ga-abụ na ebube na ịdị ukwuu ya adịghị eme ka unu maa jijiji? Egwu ya ọ dịghị atụ unu? 
Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ; okwu ngọpụ unu dịka ihe ngọpụ ụrọ. 
“Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu; ihe ọ pụtara ya pụta. 
Nʼihi gịnị ka m ga-eji tinye onwe m na nsogbu, werekwa ndụ m tinye nʼọbụaka m? 
A sịkwarị na ọ ga-etigbu m aghaghị m ịtụkwasị ya obi m. Aga m ekwuchite ọnụ m gwa ya na ụzọ m dị ọcha. 
Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụta maka na ọ dịghị onye ajọ omume ọbụla pụrụ ịbịa nʼihu ya. 
Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m. Kwerenụ ka ihe m na-ekwu baa unu ntị. 
Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro, amatala m na ikpe agaghị ama m. 
Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo? Ọ bụrụ na o nwere, aga m emechi ọnụ m ma nwụọ. 
“Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke, mgbe ahụ agaghị m ezo onwe m nʼihu gị. 
Wepụ aka gị i ji emegide m, meekwa ka ha dị anya nʼebe m nọ. Kwụsị ime ka oke egwu gị mee ka m maa jijiji. 
Mgbe ahụ, kpọọ m oku, aga m azakwa gị. Maọbụ, kwerekwa ka m kwuo okwu, ka ị zaa m. 
Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere? Gosi m ajọ omume m na mmehie m. 
Gịnị mere i ji gbakụta m azụ? Gịnị mere i ji gụọ m dịka onye iro gị? 
Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ? Ị ga-achụ ahịhịa kpọrọ nkụ ọsọ? 
Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m, na-emekwa ka m ghọrọ mkpụrụ mmehie m mere nʼoge okorobịa m. 
Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ; na-enyochakwa nzọ ụkwụ m niile site nʼitinye akara nʼebe ọbụla ọbụ ụkwụ m zọrọ. 
“Ya mere, mmadụ nʼala nʼiyi dịka ihe rere ere, na dịka akwa nke nla riri. 
